diff --git "a/data/ibo/train.tsv" "b/data/ibo/train.tsv" new file mode 100644--- /dev/null +++ "b/data/ibo/train.tsv" @@ -0,0 +1,1357 @@ +category headline text url +business Miyetti Allah: 'Anyị ga-agbachi ụlọahịa anyị niile n'Enugwu steeti' Ngalaba na-ahụ maka ọzụzụ nama bụ Miyetti Allah ekwuola na ha ga-agbachi ụlọahịa niile n'Enugwu n'ụbọchị iri na anọ nakwa iri na ise nke ọnwa Ọgọst. Ha kwuru na nke a bụ iji kuziere ndị Fulani bi n'Enugwu steeti maka okwu nchekwa. N'ime akwụkwọ ozi ha ziputere ha kwuru na nkuzi a dị mkpa maka ọnwụ Fr Paul Offu nakwa ndị ọzọ. Ha kwere nkwa ịnyere gọọmentị Enugwu steeti enyemaka n'ịhazi okwu nchekwa ndụ na akụnaụba steeti ahụ. BBC ghọtara na otu ụgbọelu Medview na-aga Legọs efeghachila Abuja maka nsogbu ijnin o nwere n'ụzọ. Ka a na-ekwu nke a, ndị njem ka tọrọ n'ime ya bụ ụgbọelu dịka ndị ọrụ ọdọụgbọelu ekweghi ha bata n'ime ọdọụgbọelu ahụ. Ụfọdụ ndị a gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ha kwesiri iji Dana Air mee ya bụ njem mana emechara tinye ha n'ụgbọelu ndị Medview. Dịka ha si kwuo, o nweghi onye ọrụ Medview kọwara ha ihe na-eme maọbụ ihe na-aga aga Jeffrey Epstein bụ onye ọrụ ego anwụọla n'ime ụlọ mkpọrọ dịka ọ na-eche ka akpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo ịgba mgbere mmadụ. Cheta na achọtara ya n'oge mgbe o nwara igbu onwe ya n'ọnwa gara aga. Asọmpi Premier Lig amalitela n'uju ya dịka Man. City ji ọkpụ goolu ise asataghị otu were chie West Ham ọnụ n'ala. Ebe otu Tottenham na Aston villa na-achịpụ ya ugbua ị ma mbe na abọ nke bụ oke. N'egwuregwu, n'abalị asaa nke ọnwa Disemba afọ a ka nwaafọ Naijiria bụ Anthony Joshua ga-enwe ohere ịnataghachị ugwu ya n'iti ọkpọ n'aka Andy Ruiz. Dimkpa abụọ a ga-ezute onwe ha ọzọ na mba Saudi Arabia. Cheta na Ruiz kụpụrụ Joshua mkpụrụ ọkwụrụ n'anya mgbe ha zutere onwe ha n'ọnwa June, ma nara ya nturuugo IBF, WBA nakwa WBO o jibu. Mana ụfọdụ ndị na-akwado Joshua na-agbarụ ihu maka na ọgụ Joshua na Ruiz ga a bụ na mba Saudi Arabia. Ha kwuru na Saudi Arabia bụ obodo na-anaghị asọpụrụ ikike dịịrị onye bụ nke a kpọrọ 'human rights'. Ndị ọzọ kwuru na obodo ahụ ga-etere ha aka ịga lelee ọgụ a ga-akpụ ọkụ n'ọnụ. Isi ụlọọrụ nchekwa Naijiria a kpọrọ Defence Headquarters ehiwela otu ga-eleba anya n'ogbugbu ndị agha gburu ndị uweojii atọ na Taraba Steeti. Nke a bụ iji mezu iwu Onyeisiala Muhammadu Buhari nyere ka e mee nyocha iji chọpụta ebe mmiri siri baa n'opi ụgbọgụrụ. Ndị kọmiti ga-eme nnyocha a gụnyere ndị agha, ndị agha elu, ndị agha mmiri, ndị uweojii, ndị DSS na ndị Defence Intelligence Agency. Cheta na ndị uweojii na-ebo ndị agha ebubo ịgbagbu mmadụ atọ ndị otu ha ma merụọ ndị ọzọ ahụ oge ha gara nwụchie onye ntọ a ma ama na Taraba steeti aha ya bụ Alhaji Hamisu. Mana ndị agha kọwara na ha che na ndị uweojii ahụ bụ ndị ntọ n'onwe ha n'ihi na ha eyighi akwa ndị uweojii. Ndị mba Turkey a tọọrọ n'oshimiri enwerela onwe ha A tọhapụla ndị mba Turkey mmadụ iri bụ ndị a tọọrọ n'ụgbọ mmiri n'oshimiri dị nso na Naịjirịa n'izuụka atọ gara aga. Ndị ahụ nọ n'ụgbọmmiri si Cameroon aga Ivory Coast oge ndị a na-eche na ha bụ ndị ekperima wakporo ụgbọ ha ma tọrọ ha. Akụkọ kwuru na a tọhapụrụ ndị ahụ n'ụbọchị Satọdee na-akwụghị ụgwọ ọbụla. Ọkaiwu ha aha ya bụ Selcuk Esenyel kwuru na otu a kpọrọ Niger Delta Peace Advocacy Group nakwa ndị Riverine Peace Initiative in Niger Delta tinyere ọnụ n'okwu ahụ. North Korea agbaala ogbunigwe N'ofesi, mba South Korea na-ekwu na ndị North Korea gbara ogbunigwe elu abụọ n'ụbọchị Satọde, Ọ bụrụ na ebubo a bụrụ eziokwu o gosiri na North Korea e nupula isi na mkpebi iri na otu nke ndị otu United Nations Security Council manyere ha gbasara ogbunigwe elu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-49304476 +politics 'Biafra na-enye anyị ohere ihe anyị nwereike ịbụ' - Ọkaikpe Nkemdilim Izuako Okwu inweta Biafra bụ nke na-ewu ewu kamgbe ebe ọtụtụ ndị Igbo ọkachasị ndị ntoroọbịa na-ekwu ka e mee refarandum. Okwu a bụ nke na-ebiri ọkụ kamgbe nke mere na ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa etinyela ya ọnụ. BBC Igbo zutere otu onye ọkaikpe na-arụ n'otu mbaụwa United Nations aha ya bụ Ọkaikpe Nkemdilim Izuako bụ onye tinyere ọnụ n'okwu gbasara Biafra. O kwuru na ya na-echeta agha Biafra, na ya na-eji obi aṅụrị echeta ya maka na agha ahụ gosiri ụmụIgbo ihe ha nwereike imepụa n'onwe ha mana o bere arịrị na agha bere, ụmụIgbo etufuo ihe niile ha mepụtara oge agha. O kwuru na ugbua, okwu Biafra ekwesighi ịbụ ịzọ oke ala kama ndị ọnụ na-eru n'okwu kwesiri ịkpa nkata ime ụlọ gbasara ya. Gịnị ka ha ga-akpa n'ime ụlọ, kirie onyonyo a ka ị ch��pụta ihe ọ gwara BBC Igbo. Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/50462532 +sports Arsenal vs Lyon: Ekwe akụọla Arsenal n'isi Moussa Dembele ji goolu abụọ gbarie ndị Arsenal obi ka ha zutere ịzọ Iko Emirates. Na Pierre-Emerick Aubameyang nyere otu goolu na nkeji 35 e ji bido bọọlụ azọghị ha n'aka Lyon. Arsenal nọ na-akpa ike ka goolu mbụ ahụ wụbara na mpio, mana ha amaghị ihe chere ha n'ihu makana Dembele bịara tete n'ụra n'ọkara nke abụọ ma zuo ha ike n'ahụ. Goolu abụọ nyere Lyon mmeri 2 - 1 ha ji merie, sụbachara na nkeji 66 na nkeji 76. Gabriel Martinelli Arsenal ka zụrụ azụ chere na ọ gbakpuola goolu mbụ ọ na-enye dịka onye Arsenal ka batara ọhụrụ, mana a gụfuru ya tupu Dembele emewaa ha obi. N'agbanyeghi na ọ bụ asọmpi enyi na enyi, ọ bụ asọmpi ndị otu egwuregwu ndị ụlọọrụ Emirates na-akwado, na-agba kwa afọ. Ndị otu egwuregwu abụọ a gbachiri nkịtị ka otu nkeji gafee; iji kwanyere Jose Antonio Reyes nwụrụ anwụ n'ọnwa Juun ugwu. Ihe nkiri a ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49146745 +entertainment Nigerian Celebrities: Lekwa ihe mere ka ndị a ama ama wuo n'ízu a Dịka izuụka a na-abịa n'isi njedebe, anyị na-ewetara gị ihe ndị ama ama ụfọdụ mere nke dara ụda. DAVIDO Obi bụ Davido sọ anụri dịka enyị ya nwaanyị, Chioma mụrụ nwaa nwoke na Sụnde gara aga. Kama ndị osochiegbu bịara ime ya obi ọjọọ mgbe ha boro ya ebubo na ọ tụwara otu n'ime ha ime. Ụmụagbọghọ a mechara kwugharịa si na ha na-ama ya njakịrị. Ha rịọkwara Davido ka ọ gbaghara ha na ọ bụ egwuregwu. Kama Davido sị 'Njakịri laa azụ' ha ka atakwute ya kọnkịrị n'ụlọ mkpọrọ. I mara afọ ole Okey Bakkassi dị? Otụtụ amaghị mana nwoke a agbaala afọ iri ise. Bakassi mezuru ya afọ iri ise ọnọọrola n'elụ uwa n'ụbọchi Wenesde gara aga. Lekwa ụfọdụ ozi ekele ezitere ya. Meghan Markle,'Duchess of Sussex' Harry na Meghan bụ aha nọ ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnụ n'izu a. Ha abụọ bụ Duke na Duchess nke obodo Sussex dị na mba Ịmgland. Ụfọdụ kwuru nke di mma ebe ụfọdụ kwuru njọ maka ha. Mana Meghan akatọọla etu ndị ntaakụkọ si ebu akụkọ maka ndụ ya na ezinụlo ya. Lee ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka ya - Kanye West wuru na Sọshal Midịa maka egwu ọhụrụ o tipụtara, ọkachasị nke ọkpọrọ 'Jesus is Lord'. Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ya. Frodd onye ezigbo aha ya bụ Chukwuemeka Okoye gọsipụtara obi mwute o nwere dịka ọ gara leta ndị Onịcha ọkụ tanka gbara metụtara. Lee ihe ekwuru maka njem ya na Twitter CHIZZY ALICHI Nwaada a makarịrị 'mamiwọta' na mma biara nọnyere BBC Igbo n'ụbọchị Fraịde. O sonyere n'ihe omume anyị a kpọrọ 'Gịnị na-afịọ'. Lee ka o siri gaa. Akụko ga-amasi gị Ihe nkiri ga-amasi gị: https://www.bbc.com/igbo/50186049 +politics Ghana Election 2020: Ndị pati mgbagha mba Gana ajụla mpụtara ntuliaka nyere Nana Akufo-Addo mmeri "Pati anọghị na gọọmentị mba Gana bụ ndị isi mgbagha ajụla mpụtara ndị ọrụ ntụlịaka ha nụ Ghana Electoral Commission wepụtara bụ nke nyere Nana Akufo-Addo mmeri. Ya bụ Pati ndị mgbagha bụ National Democratic Congress sị na-enwere ọtụtụ nrụrụaka na ya bụ ntuliaka mana ha ga-agwa ụwa ebum n'obi ha mgbe adịghị anya. Ndị ụlọọrụ ntuliaka mba ahụ bụ nyere Nana Akufo-Addo mmerị ka ha mechere ntuliaka onyeisiala mba ahụ. Ndị ọrụ nnyocha ya bụ ntuliaka mba Gana nakwa ndị mba ofesi sị na enweghị ihe nruruaka ha hụrụ na ya bụ ntuliaka. Akufo-Addo nke otu 'New Patriotic Party' (NPP) ji voootu dị pasent 51.59 nke bụ vootu dị ọnụọgụgụ 6,730,413 were merie. Ngụkọ vootu a tụrụ na na ntuliaka mba ahụ ka na-aga n'ihu dịka a gụkọchabeghị vootu nile a tụrụ na ntụliaka ahụ mana onyeisi EC bụ Jean Mensa kwuru na nke a gụrụla ezuola ịma onye meriri. Mensa kọwara na mpụtara ọ kpọpụtara enweghi vootu mpaghara ndida Techiman n'ihi na ngụkọ ka na-aga ihu ebe ahụ. E mechaala ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Gana dịka ndị ọrụ ntuliaka si kwuo Ihe fọrọ ugbua bụ ka a gụkọọ mpụtara ntuliaka ndị a na mpaghara iri na isii ebe e mere mbinyeaka n'akwụkwọ ma kpọpụta onye meriri. Ndị uweojii Gana nwuchiri ndị ọrụ ntuliaka abụọ aka ha dị na nrụrụaka n'Awutu Senya West na Bawka Central. Onyeisi ndị uweojii Gana sị na a gbara mmadụ abụọ egbe na mpaghara Awutu Senya East. Onyeisiala ha bụ Nana-Akufo-Addo arịọla ka udo chịa na mpaghara niile. Ọ bụ n'ime otu ụbọchị ka a ga-ama onye meriri. Etu ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Gana si gaa Akụkọ a chịkọtara ka ntuliaka nke ọkwa onyeisiala mba Ghana si aga ugbua. Onyeisiala mba , Nana Akufo Addo atụọla vootu ya na woodu Rock Ages preparatory school 1and 2 Kibi. Ọ sị na obi dị ya ụtọ etu ntuliaka ahụ si aga nke ọma na mba ahụ. John Mahama bụ onye ji ọkọlọtọ pati NDC nakwa aka chiburu Ghana atụọla vootu ya. O kwuru na oge ka pere mpe ikwu ka ya bụ ntuliaka si aga mana o ji nkeji atọ tụọ vootu ka ọ tụchara vootu na Bole. Ndị uweojii nọ na Ghana ekwuola na amabeghị ma ebubo na-afọjuru igbe ntuliaka na ndịda anyanwu Ghana abụ eziokwu. Ha kwuru ka ndị Ghana dere jụụ makana ha na-enyocha ma ebubo a abụ eziokwu ma gwa ha nchọpụta ha. Ọnụọgụgụ ndị ga-atụ vootu na ntuliaka a Ntuliaka a ga-eji họpụta onye ga-abụ onyeisiala mba Gana malitere n'ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba afọ 2020. Ihe ruru mmadụ iri na otu gụnyere onye bụ onyeisiala aha ya bụ Nana Akufo-Addo so azọ ọkwa mba ahụ. Onye ọrụ BBC nọ n'ebe ahụ kọwara na ndị mmadụ pụtara n'ọgbọ ntụliaka kamgbe elekere abụọ nke etiti abalị ịkwụnye n'ahịrị maka ntuliaka ahụ. A ga-eme ntuliaka a n'ọgbọ ntuliaka ruru puku iri atọ na asatọ n'ogbe iri na isii dị na Ghana. Onyeisioche Ghana Electoral Commission kwuru na ọ bụ nanị ngalaba ha nwere ikike ịkpọpụta vootu dịka iwu si kwu. Onyeisiala mba Ghana ugbua bụ Nana Akufo-Addo kwuru na ndị Ghana ekwekwala ka Covid-19 nabichie ha ipụta tụ vootu makana ndị ọrụ nchekwa ga-ememina ndị osochi egbu. Obere ọgbaghara dapụtara na ""City Engineer' polling station dị n'obodo Odododioodoo dị na Ghana Obere ọgbaghara dapụtara na 'City Engineers polling station, Odododioodoo Constituency' ka ndị na-atụ vootu malitere ịba mba maka etu ụfọdụ si akagbu vootu ha. Mana ndị ọrụ nchekwa pụtarakwara ozigbo belata ya bụ ọgbaghara. European Union Observer Union na-enyo ka ntuliaka si aga na mba n'ogbe Ofododioodoo. Ha gwara ndị ntaakụkọ okwu dịka ha na-ele etu ihe si aga." https://www.bbc.com/igbo/afirika-55212698 +entertainment Imo Bride Price: Ihe ọ na-ewe iji lụọ nwaanyị na Mbaise "Mbaise bụ okpuruọchịchị a ma ama n'Imo steeti n'ala Igbo. Mana ugbua, ọ bụ ihe ọzọ mere ka ha bụrụ okwu a kpụ n'ọnụ ma na-ewu ewu. O si n'ihe onyonyo otu nwa amadi wepụtara na soshal midia na-akatọ ndị Mbaise na omenala alụmdinanwunye ha. Nwa amadi a kpọrọ onwe ya Aloy kọwara etu nwanne ya nwoke si gbahapụ imeego n'isi nwunye ya maka oke ego ndị ọgọ na-ana ya. Nke a mere ka BBC Igbo kpọtụrụ ndị ma ihe na-aga na Mbaise ka ha kọwaa ihe ọ ga-ewe ịlụ nwaanyị Mbaise. Benedicta Nwokocha Akuezi gwara BBC Igbo n'ekwentị kwuru na 'list' eji alụ nwaanyị dị icheiche dịka omenala ndị sị dịkwa icheiche. N'ọnụ ya ""o nweghi iwu e debere na-ekwu ego ole e kwesiri iji lụọ nwaanyị na Mbaise"" Nwokocha mara atụ sị na ụfọdụ ụmụnna nwere ịkpa aka n'ihe e dere na 'list' ma ọ bụrụ na ha hụ na ọgọ ha ji ezigbo ego. O kwukwara na ezinaụlọ dị icheiche na-eme ihe sọrọ ha ma ọ bụrụ na ọgọ ha nwoke ji ego dịka ị nara ego ""ịkpughe ihu nwaanyị"" ""Nke ahụ esoghi na omenala ndị Mbaise, ọ bụ ịbara nọ n'egwuregwu dị na alụmdi na nwunye ka ihe ahụ bụ"" Usoro e ji alụ nwaanyị Mbaise Nke a bụ ego ndị ọgọ ga-eji kwadoo maka ọbịbịa ndị ọgọ. Ọ kọwara na ụfọdụ ezinụlọ na-etinyekwu ego na ego ma ọ bụrụ na nke ọgọ ha wetara agaghị ezu. Ọ bụ onyeisi ndị amaala ga-agụpụta ihe ndị dị na 'list' mara ma o zuru ezu. O nwere ụfọdụ ihe dị mkpa ekwesighi ifu efu n'ime List ahụ Mgbe ndị ọgọ abụọ kwetara n'ihe niile dị na 'list', ihe ọzọ bụzị ịnwebe aṅụrị Ya bụ ma oriri ma ọṅụṅụ ma ịgba egwu na ihe ndị ọzọ sọ ọlụlụ nwaanyị. Ihe aghaghị ịhụ na ""list"" n'obodo Mbaise - Mmanya ngwọ/mmanya nkwụ . - Ọjị Igbo na ose ọjị. - Mmanya 'Beer'. -Mmanya ọkụ (schnapp) - Anwụrụ, isi anwụrụ, nnu anwụrụ. - Ji (nwereike iru otu narị maọbụ iri ise). - Mmanya ọkụ. - Anwụrụ Bekee. -Ego ive efere - nke a na-emere ụmụnwanyị. - Isi ego. 'N100,000 agaghị azụta ihe niile dị na 'list' Nwokocha kọwara na ụfọdụ ụmụnwoke na-atụnye nwaanyị ime iji gbalahụ 'list' dị oke ọnụ. ""Nke ahụ bụ 'Short Method' ka a na-kpọ ya mgbe anyị nọ n'agbọghọ"" mana n'uche ya otu narị puku naịra (N100,000) agaghị ezu iji gokọta ihe e ji alụ nwaanyị na Mbaise. Dịka o si kọwaa, ego anaghị efu na ime ego isi nwanyị, kama ọ bụ site n'ihe e dere na 'list' ka e si emefu ego. ""Onye chọọ ime akụ nwanyị n'ọnwa Disemba, mmanya na ihe ndị ọzọ ga-aka dị oke ọnụ karịa n'ọnwa Mee"" Mana na ngwụcha, Nwokocha kwuru na ihe dị mkpa bụ ihe onye chọrọ ịlụ nwunye na ndị ọgọ ya kwekọrịtara. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49720179 +health Coronavirus in Nigeria: Mmadụ ise ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa Mmadụ ise ọhụrụ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa. Ngalaba mgbochi ọrịa bụ 'National Centre for Disease Control' kwupụtara nke a n'ụbọchị Wenezde. Nke a pụtara na ndị butere ọrịa coronavirus na Naịjirịa eruola asatọ. Abụọ n'ime asatọ a agbakeela. Ụlọọrụ NCDC kwuru na mmadụ ise ọhụrụ mere njem gaa mba Briten maọbụ Amerịka. Ọbụghị n'aka onye mbụ bubatara ọrịa ahụ ka ha si bute ya. Ha kwukwara na ha na-agba mbọ ugbua ịchọpụta ndị niile ha na ndị ahụ mekọtara ahụ kamgbe ha lọtara. Nke a na-abịa dịka gọọmentị Naịjirịa machiri ndị si mba ebe coronavirus ka njọ ịbata na Naịjirịa. N'ọgbakọ 'Federal Executive Council' n'ụbọchị Wenezde ka a nọrọ nwee nkwekọrịta a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-51941033 +sports Victor Moses enyeela goolu mbu ya na Turkey Akụkọ dị mkpa Nwaafọ Naịjirịa na-agba bọọlụ na mba ofesi bụ Victor Moses jị ọkpụ goolu gwa ndị Turkey na ya abịara. Moses si Chelsea gawa otu bọọlụ Fenerbache nyere goolu ya n'ime nkeji iri ọ batara ọgbo egwuregwu. Osote Onyseisiala Naịjirịọ bụ Ọkammụta YemiOsibanjo jiri nwapem gbalahu onwu taa dịka ụgbọelụ helịkọpta bu ya ta dara n'ike n'ogbọ egwuregwu dị na Kabba Kogi steeti. Osinbajo ezipụla ozi na ahụ dị ya mma site n'akara Twitter ya na-ekwa kwa na o kwenyere na Chinke ga-echekwa ha n'oge a. Atiku Abubakra bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru otu PDP ezigarala Osinbajo ozi itiakanobi site n'akara Twitter ya. Igwe obodo Oko dị na Anambra steeti ekelela ndị mmadụ pụtara ị kwanyere nwanne ya Alex Ekwueme ugwu dịka a na-eme emume ncheta olili ya taa n'Oko. Obi na-achị ọnịcha nakwa Mazi Solo nọchitere anya aka na-achị steeti ahụ bụ Willie Obiano gụnyere na ndị nnukwu mmadu bịara ya bụ emume. Ndị na-akwado onye kpọrọ onqw ya onyeisiala mba Venezuela bụ Juan Guaido ebidola ngagharịwe taa dịka ụfọdụ mba ndị Yurop na-akwanye Nicholas Maduro ọkụ n'ike ka ọ mee ntuliaka ọhụrụ. Akụkọ na-eru BBC ntị bụ na nkwado Ohaneze Ndịgbo nyere onye na-azọ ọchịchị n'okpuru patị PDP bu Atiku Abubakar ebutela ogbaghara n'etiti ya bu ọtụ. Ka ọkwụ ugbua, Uche Okwukwu bụ ode akwụkwọ Ohaneze na-akọwa na enyerela onyeisi Ohaneze bu Nnia Nwodo ezumike. Mana Uche Okpaga bụ bụ ode akwukwọ mgbasa ozi si na ọbụ Okwukwu ka enyere ya bụ ezumike. Ndị Boko Haram gburu ihe ruru mmadụ iri isi n'obodo Rann di na Borno steeti ụbọchị Monde nke isu a. Nke bịara n'azụ ndị agha Naịjirịa hapụrụ ha bụ obodo ka Boko Haram wakpochara ya. Aka na-achị steeti Virginia dị na mba AmerỊka bụ Ralph Northam na-arịọ mgbaghara maka foto otinyere n'akwụkwọ mgbe ọ nọ ụlọakwụkwọ n'afọ 1984. Foto ndị na-ewe ụtụtụ mmadu iwe makana ha sị na ọ na-akwado oke agbụrụ emela ka ọtụtụ sị ka Northam rituo n'ọkwa dịka GỌVANỌ Ọ ga-akpọtụ na Legọs taa n'emume ọsọ akpọrọ Lagos City Marathon na Bekee. A na-eme Lagos City Marathon kwa afọ. Nke a bụ afọ anọ ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-47088189 +politics Frank Ibezim: E duola ya n'iyi ọrụ dịka onye nnọchiteanya Imo North n'ụlọomeiwu ukwu "Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ahmad Lawan eduola Chukwuma Frank Ibezim n'iyi ọrụ dịka onye omeiwu na-anọchite anya Imo Nọt n'ụlọomeiwu ukwu. Ibrahim El-Ladan bụ oje ozi nke ụlọomeiwu ukwu ka Lawan nyere iwu ka o duo ya n'iyi ọrụ. Ka ọ na-edu Ibezim n'iyi ọrụ n'ụbọchị Tuzde, 27 nke ọnwa Epreelụ 2021, Lawan kwuru sị ""Site n'ịṅụ iyi ọrụ a, anọchitela Imo Nọt anya ọfụma."" Cheta na Ibezim na Ifeanyi Araraume bu okwu gbasara onye meriri na ya bụ ntuliaka gaa ụlọikpe mgbe e mechara ntuliaka n'ụbọchị ise nke ọnwa Disemba 2020, maka oche ahụ. Onwuasoanya FCC Jones onye na-ekwu na ọ bụ ya bụ onye mgbasa ozi APC n'Imo steeti, ka na-ekwusi ike na ọ bụ Ararume meriri ya bụ ntuliaka. O kwuru na ọ bụ n'Owere ka ụfọdụ ndị nọrọ gbaa izu ma kpọpụta aha Frank Ibezim dịka onye meriri ntuliaka ahụ. Onwuasoanya dọkwara aka na ntị ka ndị isi APC nọ n'Abuja nakwa Inec kpachapụ anya ma ghara iwepụta Frank Ibezim ka ọ nọchite anya ndị APC na ntụliaka ahụ. Ọ gara n'ihu kwuo na dịka Gọvanọ Hope Uzodinma kwuru na ya si ụzọ 'Ben Johnson' bata n'ọchịchị, na ha agaghị ekwe ka o mee otu a ọzọ. Okwu nke a na-abịa dịka ndị isi otu APC n'Abuja nakwa Inec kpọpụtara aha Frank Ibezim dịka onye meriri. Enyinna Onuegbu, onye sokwa na ndị isi APC n'Imo steeti, gwaburu BBC Igbo n'ekwentị na FCC Jones bụ onye ọchọnganoko. O kwuru sị: ""Onye meriri ntuliaka ime ụlọ anyị mere n'Imo North bụ Frank Ibezim."" ""Ọ bụ ya ka ndị isi pati anyị nọ n'Abuja ma."" Onuegbu kwukwara na akwụkwọ ahụ na-egosi aha Ararume dịka onye meriri ya bụ ntuliaka bụ okpotokpo as���. Oche ndị Imo North n'ụlọ omeiwu ukwu ghe oghe ugbua n'ihi na Benjamin Uwajumogu onye nọbụ na ya alaala mmụọ. Ngalaba nhazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' kwuru na ọ bụ na abalị ikpeazụ nke ọnwa Ọụtoba ka ha ga-eme ntuliaka iji họpụta onye ọhụrụ. Pati ndị ọzọ a ma ama emekwaala nhọpụta nke imeụlọ ma wepụta ndị ga-anọchị anya ha na ya bụ ntuliaka. Dịka akụkọ si kwuo, otu 'Peoples Democratic Party' họpụtara Mazị Patrick Ndubueze onye okpuruọchịchị Okigwe, ebe ndị 'All Progressives Grand Alliance' họpụtara Mazi Charles Onyirimba onye okpuruọchịchị Ehime Mbano." https://www.bbc.com/igbo/afirika-54024071 +politics Miyetti Allah: Ihe mere ha ji bụrụ okwu akpụ n'ọnụ na soshal midia Akụkọ ndị kachasị mkpa taa: Otu Miyetti Allah akpala agụ aka n'ọdụ. Ụmụ Naijiria na-ewere ha iwe maka okwu otu onyeisi ha na Benue steeti bụ Alhaji Garus Galolo kwuru ebe ọ kpọrọ oku ka Bukola Saraki tinye akwụkwọ arụkwaghịm dịka onyeisi ụlọomeiwu ma ọ bụghị otu ahụ, ha amanye ya ka ọ hapụ ọkwa ya dịka onyeisiala. Otu PDP site n'ọụ ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Kola Ologbondiyan katọrọ okwu ahụ ma kpọọ Onyeisiala Buhari oku ka ọ nwuchie ndị ndu otu Miyetti Allah, ma ha ikpe maka 'atụmatụ Igbo Ekulie kpọrọ oku ka gọọmenti hapụ ụmụnwaanyi a Ọgbakọ ụmụafọ Igbo maara nke ekwe na akụ na ọrụ bụ Igbo Ekunie Initiative agbarụọla ihu kpọọ oku ka ndị uweojii tọhapụ ụmụnwaanyị Igbo ruru otu narị ha ji eji. Ndị uweojii kpọchiri ụmụnwaanyị a maka na ha mere ngagharịiwe ka gọmentị etiti tọhapụ Nnamdị Kanu bụ onye ndụ Ipob ejieji kemgbe afọ gara aga. Osote onyeisi ụlọomeiwu Sineti bú Ike Ekweremadụ akpọọla oku ọzọ ka ọnọdụ onyeisiala na nke ndị gọvanọ bụrụ otu ugboro afọ isi. Ekweremadụ, bụ onye na arụ ndị ọrụ gọọmenti etiti aka maka ọgbaghara dị ,tụrụ ariri maka tigbuo zogbuo di na ndorondoro ọchịchị ugbua ebe ejighizi ezi ọchịchị kpọrọ ihe maka ntụlịaka 2019 na abịanu. Na mba ofesi, N'ofesi, Mba Amerịka amanyela ego ruru ijeri dola iri na isii na ngwahịa si China. Ngwahịa ndị a gunyere kemical, plastik nakwa ọgbatumtum. China ekwuola na-ga ga-emekgwara. David Beckham wụsara akpụkpọ ụkwụ o ji agba bọọlụ n'afọ 2013, ga-enweta nturuugo n'aka otu UEFA. N'egwuruegwu, obi adịghị ndị na-agba bọólụ na Spain mma ebe ndị mkpokota ha bụ La Liga kwetere iburu asọmpi ha buga na mba Ameriika. Sergio Ramos na Sergio Busquets bụ ndị nọ na isi okwu a sị na aka ndị ọgbaa bọọlụ esoghị na ya bụ nkwekọrịta ma kwukwe na ha nwere ike ịgba abụbụ ọrụ maka ya. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Na agbanyeghị nsogbu dị n'etịtị ndị obodo ọzọ dị na Naịjirịa na ndị Fulani na-achi ehi, Akwuke n'Enugwu steeti na ndị na-achị ehi na-ebi n'udo. https://www.bbc.com/igbo/afirika-45281027 +health Coronavirus: 'Agụụ ga-egbu anyị na ụmụaka ma gọmenti mechie ahịa n'Enugwu' Dịka gọọmenti Enugwu na-amalite mmachị ahịa, ụka, njem nakwa ngagharị ọbụla, ụmụ nwaanyị na-azụ ahịa na Akwata arịọla gọọmentị Enugwu steeti ka ọ ghara imechi ahịa kpam kpam. Ha kwuru na nke a bụ n'ihi na ha enweghị ego ha ga-eji zụọ ụmụ ha nri. Mgbe BBC rutere na ya bụ ahịa, ndị ahịa ahụ kọwara na ka ha si eri nri bụ site na igota tomato, ose nakwa yabasị kwa ụbọchị, ree ya were nweta ọmụrụ nwa. Ha rịọrọ gọọmenti ka o nye ha ego iti aka n'obi tupu emechie ahịa ahụ n'izu ụka a, ka agụụ ghara igbu ha na ezinaụlọ ha. Gọọmenti Enugwu steeti mara iwu ka ahịa, ụlọ ọrụ, ụlọ ụka nakwa njem gbaa bụreki malite echi site na ndị mmadụ ịnọrọ n'ụlọ ha ka ewere buso nje Coronavirus agha. Onye mere akụkọ a bụ Ebere Ekeopara. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52081647 +entertainment Etu m si chọpụta na George Obinna Floyd bụ nwafọ Mbaise - Humble Okoro "Ụkọchukwu Humble Okoro nke ụlọụka Joy Christian Church dị na Pọtakọt akọwala ihe mere o ji ligharịa George Floyd bụ onyeisi ojii ndị uweojii gburu n'Amerịka n'ọnwa Mee. Ụkọchukwu Okoro hazigharịrị akwamaozu George Floyd n'obodo Umuoffor dị n'Obokwu Obibi Aboh Mbaise nke Imo Steetị. Ọ gwara BBC Igbo na George Floyd si n'agbụrụ otu nwoke Mbaise mụrụ otu nwa ma kpọrọ ya gaa Kameroon, si zie ebe ahụ gawa mba Amerịka ga biri. Ọ sị na nke a si n'akụkọ a kọrọ ya tinyekwara na ị bịa n'obodo Umuoffor Obokwu na e nwere ọtụtụ ndị gbara dimkpa yiri George Floyd. Ọ sị na nyocha o mere gosiri na George Floyd bụ onye agha si Mbaise nwụrụ n'Amerịka na ọ bụ ya mere o ji kpọọ aha ya ""George Obinna Floyd"". Ụkọchukwu Okoro sị na ọ ga-akpọ oku ka eme nyocha 'DNA' iji mata kpọmkwem na George Obinna Floyd bụ nwafọ Umuoffor Obokwu Mbaise. Ọ sị na obi dị ya ụtọ na ha eligharịala ""George Floyd Obinna"" n'akụkụ ndị nna nna ya ochie. N'ọgbakọ Akwamozu a, edosara igbe ozu e biri foto ""George Floyd Obinna"" n'elu ya, ebe ụfọdụ ndị nwoke na nwaanyị yi akwa ojii dịka ndị na-eri uju nọkwa ebe ahụ. Cheta na e liri George Floyd n'Amerịka n'ụbọchị 10 nke ọnwa Juun, afọ 2020. Mana otu nwoke a kpọrọ Sam Anuka bụ onye obodo Ufoama Obibi Ngwu sị na ọ maara ezinaụlọ ụkọchukwu Humble Okoro nke ọma. Na Okoro bụ onye obodo Obokwu Obibi Ngwu, na ọ bụ onye ụkọchukwu otu ụlọụka ọgbara ọhụrụ dị na Pọtakọt. Anuka sị na Okoro na-eme ihe nkiri na ọ bụ ihe nkiri ka a sị na ọ na-eme maka olili George Floyd na ọ bụghị ezi akwamozu. Ihe ndị mmadụ na-ekwu @KinyanBoy sị na e nwechara ndị na-ebe akwa n'ebe ahụ. @EniolaJeremy jụrụ sị na mgbe i chere na ị hụchaala ya, Naịjirịa ga-abụta zi gị nke tọrọ Biati @daisythemogul sị na ndị Igbo na-aghọ aghụghọ Akụkọ ka na-abịa..." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53577872 +health US Medical: Gịnị mere ụmụnwaanyị Naịjirịa ji agbaga US ịmụ nwa? "Nwanne ị ma ihe mere ụfọdụ ndị Naịjiria aga ịmụ nwa n'Amerịka? Ị nwereike ịjụ ihe mere anyị ji ajụ ajụjụ a ma ọ bụrụ na ị nụbeghi na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-akwado imachi ndị na-esi mba ọzọ abịa amụ nwa na mba ya. O kwuru na tupu i tinye akwụkwọ inweta ikike ịbịa Amerịka mụọ nwa, ị ga-egosiputa na ị nwere ego na mmasị ịkwụ ụgwọ ụlọọgwụ gị nakwa gosi onye na-enye 'visa' na gị na dọkịta ekwekọrịtala maka nlekọta gị. N'ihi atụmatụ a bụ ihe Bekee kpọrọ 'anchor baby', ọtụtụ ndị mba ọzọ amụtala ụmụ ji akwụkwọ ikike na-egosi na ha bụ ndị mba Amerịka n'agbanyeghi na ha bụ ndị mụrụ ụmụ ahụ ji akwụkwọ si mba ọzọ. Ọtụtụ ndị Naịjirịa sokwa na ndị a na-aga amụ nwa na mba Amerịka, mana kedụ ihe mere ha na-eji aga? 1) Nlekọta ahụike ka mma: N'afọ 2017, BBC gosiri etu otu nwaanyị Naịjirịa si mụọ ụmụejima anọ n'ọdọụgbọelu dị na mba Briten ka o si Amerịka na-alaghachi Naịjiria makana a chụghachịrị ya azụ. Ka ọ mụchara nwa, o jide ụgwọ ruru paụnd puku narị atọ na iri atọ. Nwaanyị a kwuru na dọkịta ya gwara ya na ọ ga-akara ya mma ịmụ ụmụ ya ndị a n'ala Bekee; ebe e nwere ụlọọgwụ dị mma ebe a ga-enwe ike ilekọta ya ọfụma. N'ihi ezigbo ụlọọgwụ na nlekọta ahụike ka ọtụtụ ndị na-eji achọ ka ha gbaga Amerịka gaa mụọ nwa. 2) Ịnata akwụkwọ ikike: Ihe ọzọ na-eme ka ndị mmadụ na-agbaga Amerịka ịmụ nwa bụ ka nwa ha nwee ikike ịza onye Amerịka. Onye ọbụla ma na onye ọbụla ji akwụkwọ ikike njem Amerịka bụ passport' na Bekee, abụrụla onye mba ahụ; otu ụzọ na-araghị ahụ iji nweta ya bụ ịbụ onye a mụrụ n'ala ahụ. Uru dị na ya nye gị bụ nne na nna si mba ọzọ mụọ nwa ebe ahụ bụ na nwa gị tozuo afọ iri na asatọ (18), o nwereike itinye akwụkwọ n'aha gị ka gị na onwe gị nweta akwụkwọ ikike ịbụkwa onye mba ahụ. 3) Ọ bụ ihe 'nganga': Ụfọdụ ndị agaghị ekwe akpọ okwu aha, mana ihe mere ha jiri gaa mba Amerịka ịmụ nwa bụ ka ha nwee ihe ha ga-eji tuo ọnụ ma ọ bụ nyaa isi. N'ihi ohere ime ""ị makwa ndị anyị bụ"", ụfọdụ na-ebiri ego ha ga-eji gbaga mba Amerịka mụọ nwa. Ụfọdụ oge, ndị Amerịka na onwe ha agbasaala akụkọ na-egosi na ụfọdụ ndị abịala mụọ nwa ma jide ụlọọgwụ ndị Amerịka ụgwọ. 1) Kenneth Okolie 2) Daniel K Daniel 3) Ruth Kadiri-Ezerika Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51217805 +sports Samuel Chukwueze: Nwaafọ Igbo a nọzị n'ofe ugbua "Nwaafọ Igbo bu Samuel Chukwuezu nọzị mma na-ekwe oyooyoo ugbua dịka o sonyeerela ụlọọrụ 'Roc Nation Sports.' Roc Nations Sports bụ nnukwu ụlọọrụ na-elekọta ndị egwuregwu dị icheiche nke onye nwe ya bụ otiegwu a ma ama aha ya bụ Jay Z. Ụlọọrụ ahụ kwupụtara nke a n' akara Twitter ha ụbọchị Tọzde, na-eto Chukwueze dịka otu n'ime ndị ntorobịa bụ ọkacha agba bọọlụ na mba Afrịka. Ka ọ dị ugbua, Chukwueze esonyerela ndị dịka Romelu Lukaku na Eric Bailly nke otu egwu Manchester United dịka ndị ụlọọrụ ahụ na-elekọta anya. APC apịachiela akwụkwọ n'ụlọikpe Akụkọ sị Abuja pụta taa kwuru na ndị otu APC akpọghị onye akaebe ọbụla n'ikpe dị n'etiti Muhammadu Buhari na Atiku Abubakar gbasara onye meriri ntuliaka nke 2019. Cheta na Atiku na ndị otu ya bụ PDP gbara Buhari na ndị APC akwụkwọ na-ebo ha ebubo nrụrụaka na ya bụ ntuliaka e mere n'ọnwa March. Obi adịghị Okorocha mma Aka chịburu Imo Steeti bụ Rochas Okorocha agbarụọla ihu maka mweghara gọọmentị Imo weghaara 'Eastern Palm University' nke bụ otu n'ime mahadum ọ rụrụ tupu ọ rituo n'ọchịchị. Kọmiti nke gọvanọ Emeka Ihedioha hibere gbasara nkea kwuru na Imo steeti enweghị ego iji lekọta imirikiti mahadum nke Okorocha sị na o rụrụ oge ọ bụ gọvanọ. Ọrịa Ebola ka na-agbasakwa N'ofesi, mba Rwanda emechiela oke dị n'etiti ha na mba Congo n'ihi egwu na ọrịa Ebola nwere ike ịbata n'obodo ha. Nke a mere dịka a chọpụtara onye nke atọ nwere ọrịa Ebola na mpaghara Goma bụ Obodo ya na Rwanda nwere oke ala. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Gọọmentị Imo state ma maka akpụrụakpụ Rochas a na-akwatu ""Ihe anọ ọ dị m ka ya bụrụ na m mabu maka inye nwa ara"" Ihe Enugu state ji bụrụ 'baby ọkụ' mma zuru ahụ" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49199965 +politics Nye m Nnamdi Kanu, udo ga-alọghachi n'Ọwụwa Anyanwụ - Mbazulike Amaechi gwara Buhari "Onye okenye Igbo ọnụ na-eru n'okwu na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa bụ Mbazulike Amaechi arịọla Onyeisiala Muhammadu Buhari ọzọ ka ọ tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu na mkpọrọ. Amaechi kwuru nke a n'ọgbakọ Buhari na ndị okenye Igbo nwere n'Abakiliki n'ụtụtụ Fraịde, abalị isii nke ọnwa Mee afọ 2022. O kwuru sị: ""I chetara ihe m rịọrọ gị oge m bịara Abuja n'ọnwa Nọvemba afọ 2021."" ""Agwara m gị na achọrọ ka udo lọghachi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ tupu m lakwuru ndị nna nna m."" ""Agwakwara m gị ihe ga-eme ka udo ahụ lọghachi."" ""Biko mee ihe ahụ m rịọrọ gị, kpọnye m nwa amadi a (bụ Nnamdi Kanu), ana m ekwe gị nkwa na aga m enye gi udo n'Ọwụwa Anyanwụ."" Cheta na Mbazulike Amaechi na ụfọdụ ndị okenye Igbo gakwauuru Onyeisiala Buhari n'Abuja ma rịọ ya ka ọ tọhapụrụ ha Nnamdi Kanu. N'oge ahụ, Buhari gwara ha na ọ ga-echeba echiche banyere arịrịọ ha. Mana o mechara pụta kwuo na ya bụ okwu dị n'ụlọikpe, na ya ga-ahapụ ka ụlọikpe kpebie ya. Ụfọdụ ndị Okenye ala Igbo akpọọla oku ka Onyeisiala Muhammadu Buhari tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu bụ onye eji na mkpọrọ ndị DSS maka ebubo ịkpa nkata ịkposa Naịjirịa, iyi ndụ egwu na ịkpa aghara. Ndị okenye a nke onye kwuchitere ha ọnụ ha bụ onyeisi ndị otu ụka a kpọrọ Christian Association of Nigeria (CAN) n'ọwụwa anyanwụ bụ Rev. Father Abraham Nwali, gwara onyeisiala ụbọchị Fraịde n'ime njem abalị abụọ ọ mere n'Ebonyi steeti. Nwalị sị, ""anyi na-arịọ ka e jiri ụzọ udo kpebie ya bụ ikpe dịka nna, nna nwere obi mgbaghara, nye Nnamdị Kanu mgbaghara. Anyị chọrọ ka a gbaghara ya"". ""Anyị ji ohere a akpọkụ ndị niile na-azọ mnwereonwe ka ha kwụsị tigbuo na zọgbụọ, jiri nwaanyọ rịọwa ka e nwee Naijirịa ebe anaghị akpa oke, ebe agụụ na ụbịam adịghị. Onyeisiala Muhammadu Buhari atụpụghị ọnụ maka ya bụ arịrịọ. Cheta na gọọmentị Naịjirịa ji Nnamdi Kanu eji maka ebubo na ọ chọrọ ikpose Naịjirịa ya na ịbụ onye ndụ ndị otu omekatara ihe pụọ ụjọ bụ nke a malitere kemgbe 2015. Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwusiela ike na ọ bụ ụlọikpe ga-ekpebi ikpe Nnamdi Kanu. Buhari kwuru nke a dịka ọ na-asa ndị okenye Igbo okwu na njem nleta ọ gara n'Ebonyi Steeti n'ụbọchị Tọzde. O kwuru na ya anụla arịrịọ ndị okenye rịọrọ ya, ""mana ebe ọ bụ na okwu ahụ adịla n'ụlọikpe, ọ bụ ụlọikpe ga-ekpebi ya."" Buhari gakwara n'ihu gbarụọ ihu maka etu ndị ntorobịa si ebugharị egbe na mpaghara ọwụwa Anyanwụ na-eyi ndị mmadụ egwu. ""Onweghị onye nwere ikike ibu egbe AK-47 ma ọ bụghị onye ọrụ nchekwa,"" Buhari kwuru. ""Anụla m akụkọ dị icheiche etu ndị oyi ndụ egwu si akpa mkpamkpa dị icheiche na mpaghara a, ma na-egbusi ndị mmadụ nkịtị."" ""Ọ dị mwute na ọ bụ ndị agha anyị ji ndụ ha echekwa ndị mmadụ ka ndị ekperima a na-awakpo."" ""Ihe bụ mkpa m bụ ndị mmadụ na-agbara onwe ha mbọ, ndị aka ha dị ọcha, bụ ndị chị obi ha n'aka ugbua n'ihi mwakpo ndị ekperima."" Ndị omekome a na-akpọ ""Unknown gunmen: agbaala otu ụgbọala nakwa ọgbatumtum ọkụ n'okporoụzọ dịketere Pa-Ngele Oruta stadium dị n'Abakiliki. Dịka anya hụrụ si kwuo, ndị omekome ahụ kwụsịrị ndị niile nọ n'ụgbọala na ọgbatumtum ndị ahụ agbara ọkụ, chụsasia ha ma gba ụgbọala ahụ ọkụ. A na-eche na ọ bụ mgbe ndị omekome ahụ na-achọ ka ha jiri ike kwanye ndị mmadụ ọkụ n'ike ha nọrọ n'ụlọ ka ọdachị a mere. Onye bi n'akụkụ ebe ihe a mere na-achọghị ka akpọpụta aha ya kwuru na ndị omekome ahụ ji egbe gbalie elu ọtụtụ mgbe nke mere ka ndị mmadụ gbafuo ebe ahụ maka ụjọ ji ha. Onye ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị uweojii nakwa ụfọdụ ndị otu Ebubeagu(nchekwa ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ hibere) gbara ebe ahụ okirikiri ugbua. Mgbe onye ntaakụkọ anyị jụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Loveth Oda, Oda kwuru na ọ natabeghị ozi gbasara mwakpo a." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61350510 +health New coronavirus restriction: Tupu ị palie njem lawa ala Igbo lekwa iwu coronavirus na-achị obodo gị Dịka ndị si mpaghara Ọwụwanyanwụ na-akwado ime njem ekeresimesi n'oge coronavirus a. Ọtụtụ gọvanọ Steetị dị iche iche gụnyere ndị Ọwụwanyanwụ etinyela ụfọdụ iwu ga-ebelata mfesasị ọrịa coronavirus dịka a na-agba ekeresimesi. Nke a na-abịa dịka minista ahụike bụ Osagie Ehanire sị ka e mepegharịa ụlọ nnyocha, ụlọ ndopu iche nakwa ụlọ ọgwụgwọ niile. Ọ sị na ọ dịka Naịjirịa abanyela n'agba abụọ nke coronavirus a site n'etu ọnụọgụgụ si arị elu. Gọvanọ Imo Steetị bụ Hope Uzodinma wepụtara ozi ịdọ aka na ntị maka mfesasị ọrịa coronavirus n'oge ekeresimesi a. Iwu ndị gụnyere: Kọmishọna mgbasaozi n'Anambra Steetị bụ Don Adenuba wepụtara ozi ịdọ aka na ntị nke gọọmentị ha. Ọ sị ka ndị mmadụ ghara ịga mmemme ọbụla na-adịghị mkpa, ka ha ghara ọgbakọ ọtụtụ ndị mmadụ. Ka ha gbalịa na-ekpuchi ime ha n'ọha n'oge niile. Onye ọbụla ahụ na-arịa gbaa mbọ mee nyocha ahụ. Na mgbasaozi Gọvanọ Ebonyi Steetị bụ Dave Umahi nyere n'ụbọchị 18 ọnwa Disemba, ọ sị ka ndị Ebonyi gbasoo iwu niile na-echekwa coronavirus. Ọ sị ka ebe okpukperechi niile na-enwe ofufe naanị awa abụọ, ka e welite aka n'ime nyocha ahụ. Machie ọgbakọ ọtụtụ ndị mmadụ, onye ọbụla ga-ekpuchi imi n'ọha. O nyekwara iwu ka ụlọọrụ gọọmentị, ụlọụka, ụlọakwụkọ na ụlọọrụ niile dị n'Imo Steetị gbaso iwu na-achị coronavirus. Steetị ndị dịka Abia, Enugwu, Legọs ndị ọzọ tinyekwara iwu ọhụrụ a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-55393963 +health Covid-19 in India: Etu nsogbu Covid n'India si emetụta be anyị bi ebe a Ọrịa coronavirus na-akpa mkpamkpa na mba India ugbua. Otu nwa afọ bi mba ahụ kọwarala BBC Igbo etu ihe si kwụrụ ugbua n'obodo ahụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-56984463 +politics Nnamdi Kanu latest news: Ihe dọrọ Kanu iyi uwe isiagụ bịa ụlọikpe "Ọkaikpe Binta Nyako nke ụlọikpe 'Federal High Court' dị n'Abuja eyighariala ikpe Nnamdi Kanu bụ onyeisi Indigenous People of Biafra gaa April 8, 2022. O kwuru na ya bụ ikpe ga-ebido n'elekere iri abụọ nke ụbọchị ahụ. Mana ndị ọkaiwu Kanu chọrọ ka ebudakwuo myigharị ikpe a nso mana ọkaikpe jụrụ ajụ ma kwuo na ọ chọrọ iji ohere ahụ wee lebaa anya n'okwu ndị ọkaiwu Mike Ozekhome kwuru tupu o kpebie. Ọkaikpe Binta Nyako jụrụ ihe mere na Kanu agbanwebeghi uwe ya dịka o nyere n'iwu, nke ha sara sị na DSS jụrụ na ọ gaghị eyi uwe isiagụ ndị ọkaiwu ya chịtara. Ọkaikpe Nyako kwuru na nke ahụ esoghi n'usoro, ma jụọ ya akwa ọ chọrọ iyi. Kanu kwusiri ike na ọ chọrọ iyi ya bụ isi agụ. Mana Ọkaikpe Nyako kwuru na ọ chọrọ ka o yiri uwe nkịtị, dịka ọ na-ekwu na ọ chọghị ka o yiri uwe ọbụla na-egosi njirimara otu ọbụla maọbụ agbụrụ ọbụla. Maka enyo anya Kanu, Ọkaikpe Nyako nyere DSS iwu ka ha chọọ enyo anya ya nye ya makana ọ bụrụ na ọ nọtee aka na-eyighi ya ọ na-eme ya anya nkochi. O kpebiri ka a chọọrọ ya enyo anya ọzọ. Ọkaiwu Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor, Goody Uwazurike nakwa nke gọọmenti etiti bụ S.M Labaran nakwa ụfọdụ ọkaiwu so ha ka ekwere ka ha bata n'ụlọikpe maka ikpe nwa amadi ahụ taa bụ February 16, 2022. Ka Nnamdi Kanu wuchichara n'ụlọikpe, ọkaikpe Binta Nyako batara ụlọikpe malite ya bụ ikpe. Ụmụnne Kanu wuchikwara n'ụlọikpe. Cheta na ọ bụ ụbọchị n'ụbọchị Jenụwarị 19, 2022 ka ọkaikpe Binta Nyako nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja bụgharịrị ikpe Kanu ruo taa bụ February 16, 2022. Ọkaikpe Nyako mere nke ahụ iji tule mkpesa ndị ọkaiwu Kanu wetere n'ihu ya, gụnyere ịbịanyụ ebubo niile gọọmenti etiti boro Kanu. O kwuru na ụlọikpe ga-enye ọkaiwu gọọmenti etiti akwụkwọ mkpesa ahụ abalị ise tupu ikpe nke February 16, 2022 amalite. Kanu gọnarịrị ebubo niile gọọmenti etiti boro ya n'ikpe nke Jenuwarị 19, 2022. N'otu ụbọchị ahụ kwa ka ụlọikpe nọ n'Umuahia kwuru ka gọọment Naịjirịa kwụọ Kanu ego ruru otu Ijeri naịra maka etu e si wakpoo ụlọ ya dị n'Isiama Afaraukwu na Sepụtemba 2017. Lee ka o si aga n'ụlọikpe n'Abuja taata: Lee ihe ise a na-atụ anya ga-eme n'ikpe a taa Dịka ndị otu Ipob yinyeburu n'iwu ma mechaa sị na ha akagbuola ya, ha na-emebu ""onye ọbụla nọrọ n'ụlọ"" na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ iji kwado ikpe Kanu. Ha yinyeburu ya kwa Mọnde ọbụla, mechaa na-emekwa ya kwa ụbọchị ọbụla a na-ekpe ikpe Kanu. N'Enugwu n'ụtụtụ Wenezde, Febrụwarị 16, ndị mmadụ apụtaghị ịgara mkpa ha. Onye ntaakụkọ BBC gagharịrị akụkụ Enugwu dị iche iche gụnyere ahịa Artisan, Ogui, Otigba na ebe ndị ọzọ, wee hụ na ụzọ tọgbọ chakoo n'ihi na ndị mmadụ nọ n'ụlọ. N'Ebonyi steeti, n'isiobodo Abakaliki, ndị mmadụ kụrụ 'paa' n'ime ụlọ, dịka ọtụtụ ụlọọrụ, ụlọakụ, ụlọakwụkwọ nakwa ọdọahịa emepeghi. Ebe ndị dị ka Vanco junction, Waterworks, Gunning road, Abacha roundabout, CAS Campus wdgz, mechiri emechi dịka naanị ụfọdụ ọnụụlọahịa mepere emepe. N'isiobodo Umuahia nke Abịa steeti, ndị mmadụ amalitela imepe ọdọahịa ha nakwa ọdọụgbọala na ebe ndị ọzọ dịka awa anọ ha kwesịburu iji emepe ya gachara. Nke a mere dịka ụjọ jibu ụfọdụ ndị mmadụ ịpụta gara mkpa ha. Ụlọọrụ gọọmentị ndị dị n'Umuahia nakwa ụlọakụ nakwa ọdọmmanụ ụgbọala mepere etu ha si emepebu, mana ndị mmadụ ka jikwa akụkụ anya ele dịka ha na-agara mkpa ha. Mana n'otu aka ahụ ka ndị na-amanye ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ gbara otu keke napep ọkụ na Ngwa Road nso East dị n'Aba. Ọkaikpe Binta Nyako nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja yigharịrị ikpe Kanu ruo Jenụawarị 18, 2022 n'ụbọchị Ọktoba 21, 2021 ọ gbachara n'ụlọikpe. Cheta na mgbe mbụ Kanu gbara n'ihu ụlọikpe ukwu dị n'Abuja bụ n'ọnwa Julaị oge anwụchịchara ma tinye ya n'ụlọmkpọrọ ndị Department for State service (DSS) n'ọnwa Juun 2021. Ọkaikpe Nyako yighariri ikpe ahụ buga ya n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktoba, 2021, dịka ndị otu Ipob zipụtara ozi iwu onye nọrọ n'ụlọ maka nkwanye ugwu ya bụ ikpe. Cheta na gọọmentị etiti Naịjiria kwupụtere na ha si mba Kenya nwụchie ma kpọghachite Kanu na Naịjirịa n'ọnwa Juun nke afọ 2021. Ndị otu Ipob nakwa ọtụtụ mmadụ katọrọ etu e si nwụchie nwamadị a ma na-ekwu na iwu mba ofesi akwadoghi ihe gọọmenti etiti mere. Mana gọọmenti etiti na-ekwusi ike na Kanu gbara ọsọ ka ikpe mbụ o nwere ka na-aga ihu kamgbe afọ 2017. Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ nwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob). A makwa na ọ bụ onye ndị mmadụ na-akpụkarị n'ọnụ n'ihi etu o si ama ndị nọ n'ọchịchị aka dịka ọ na-achọ nnwereonwe n'aka Naịjirịa. Ndị Department of State Services (DSS) nwuchiri ya mbụ n'Ọktoba 19, 2015. Ọ gara ụlọikpe na Nọvemba 18, 2015. Na Septemba 2017, ọ gbafuru n'ụlọ ya dị n'Afara Ukwu, Umuahia, mgbe ndị agha wakporo be ya, dịka akụkọ siri kwuo. Kamgbe ahụ onweghi onye ma ebe ọ nọ, ma nwunye ya bụ Uchechị anyị jụrụ ajụjụ n'afọ 2018 sị na ọ maghị ebe Kanu nọ. N'afọ 2018, ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu. N'ọnwa Juun 27 afọ 2021, a nwuchiri Kanu na mba Kenya ma kpọlata ya na Naịjirịa mana mana onyeisi ụlọrụ nnọchiteanya Kenya na Naịjirịa kwuru na aka ha adịghị na nwuchi ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60372858 +politics Nigeria's Economy: Ihe ndị na-achọ Biafra sara ndị ugwu kwuru na ha bụ aka ji akụ Naịjirịa "Ralph Uwazuruike bụ onyeisi Biafra Independent Movement ekwuola na onweghị onye ma onye Abdullahi Awwal Aliyu bụ onyeisi otu akpọrọ Northern Concensus Movement bụ. ""Nke a mere na onweghị ihe anyị ga-eji okwu ya kpọrọ, onye anyị ma bụ Yerima Shetima bụ onyeisi ndị ntoroọbịa ndị ugwu."" Uwazuruike kwuru na ihe kacha ya mkpa ugbua bụ ijikọta otu niile na-achọ Biafra ka ha bụrụ otu. ""O nwezie ihe ndị ugwu chọrọ anyị enye ha. anyị agaghị agbara ha ọsọ nke anyị ji atụ ha ụjọ."" O kwuru na ụbọchị iri atọ ndị ugwu nyere ndị gọvanọ ndida nayanwụ ịkwụghachị ndị bee ha egburu ma mebie ihe ha ụgwọ ebuka, ""anyị chọrọ naanị otu ụbọchị, ha biazia mee ihe ha chọrọ ime."" Asari Dokubo bụ onyeisi Biafra Defacto Government kwuru na ndị ugwu tụrụ ezigbo asị mgbe ha kwuru na ọ bụ ha bụ aka ji akụ Naịjirịa. O kwuru na ọ bụ maka oke ụbịam dị na mpaghara ugwu mere ndị ọcha ji bụkọta ha ndị mpaghara ndida anyanwụ niile nwere oke akụ na ụba n'atụmaatụ akpọrọ ""amalgamation' na bekee. Gbasara agụmakwụkwọ, Dokubo kwuru na ọ bụ naanị agụmakwụkwọ alakụba ka ndị ugwu chịtara aja na ya mana onweghị iheọma ha ji ya mepụta. Gbasara ụbọchị iri atọ Abdullahi Awwal Aliyu bụ onyeisi otu akpọrọ Northern Concensus Movement nyere ndị gọvanọ ndịda anyanwụ maka ịkwụghachị ndị ugwu egburu n'ala ha ego iti aka n'obi, Dokubo kwuru na ụjọ anaghị atụ onye ọbụla. N'ọnụ ya, ""ha gosi anyị ndị bee ha e gburu, ọ bụrụ Nnamdi Kanu ka ha na-ege ntị, ha mara na ọ na-alafu ha."" Ọ bụruzikwa na ha chọrọ i bịa mee ihe ọbụla, anyị anaghị atụ ụjọ."" Abdullahi Awwal Aliyu bụ onyeisi otu akpọrọ Northern Concensus Movement ekwuola na ọ bụ ndị ugwu bụ aka ji akụ Naịjirịa agbanyeghị na-akpọrọ ha ndị ndabere. O kwuru nke a n'onyonyo na-efegharị na soshal media ebe ya na ndị ugwu ndị ọzọ na-enwe ọgbakọ. Aliyu kwuru na ọ bụ ego ndị ugwu si na ""groundnut pyramid' nakwa 'cotton' ka e ji mee nyocha ma chọpụta ebe e si gwupute mmanụ n'ụfọdụ mpaghara Naịjirịa mere ha ji etu ọnụ ugbua. O kwuru na o kwesiri ka e hibe ngalaba 'Northern Develpoment Commission' dịka e si hibe Niger Delta commission ma nye ọkpụrụkpụ ego ha ji ahazi ngalaba ahụ. Ihe ndị ọzọ o kwuru gụnyere: Anyị na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo nakwa ndị gọvanọ nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57543705 +business Ọgba mbọ: Onye ọkaiwu na-ere ọkpa Loveth Ifunanya Chinyere bụ ọkaiwu na-eme ọfụma ọrụ kọwara ihe mere o ji hapụ ọrụ ya bido ire ọkpa. Ọ gwara BBC Igbo na ọ bụ mgbe onye dọkịta chọpụtara otu ọrịa n'ahụ nwa ya nwoke mere o ji kwụsị ọrụ iji nwee ohere ileta nwa ya anya. Loveth sị na kama ọ ga-anọ na nkịtị na o bidoro na-esi nakwa na-ere ọkpa n'ụzọ pụrụiche nke mere ka amara ọkpa ya na Legọs. Akụkọ ihe ndị ọzọ ọ gabigara dị n'ihe onyonyo a. Ọ ga-akpalite mmụọ gị ma mekwa ka ọkpa ya gụwa gị agụ. Onye mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbahuru Akụkọ ndị ga-amasị gị https://www.bbc.com/igbo/afirika-50514450 +health Female Genital Mutilation: Abịa na Imo steeti enweghị iwu machiri ibi nwaanyị ugwu "N'afọ 2015, ndị omeiwu Naịjirịa binyere aka n'iwu a kpọrọ 'Violence Against Persons Prohibition Act', nke machiri omenala ndị na-emekpa mmadụ ahụ, dịka ibi nwaanyị ugwu. Ọ dịzi n'aka ndị omeiwu steeti dị icheiche ibinye aka n'iwu a ka o wee dị ire na steeti ha. Mana a bịa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, naanị Abia na Imo steetị bụ ndị ebinyebeghị aka n'iwu a bụ 'Violence Against Persons Prohibition Act'. Na Naịjirịa niile, naanị steeti iri na atọ binyerela aka n'iwu a. Ha gụnyere: Anambra, Benue, Cross River, Ebonyi, Edo, Ekiti, Enugu, Kaduna, Lagos, Ogun, Osun, Oyo, na Plateau. Mpaghara FCT, bụ isi obodo Naịjirịa, mere ha iri na anọ. Nwa Ibari (ọ bụghị ezigbo aha ya) alụọla di ma mụta ụmụ abụọ, mana ihe e mere mụta nwa, ya bụ aramara nke bekee kpọrọ 'sex', anaghị amasị ya chaachaa. Nsori di na nwunye, nke bụ otu ihe na-ejikọ di na nwunye ọnụ, anaghị agụ Nwa Ibari agụụ. Nke a bụ maka na e biri Nwa Ibari ugwu oge ọ bụ nwata, ma bechapụ akụkụ ọtụ ya nke bekee kpọrọ 'clitoris'. 'Clitoris' bụ akụkụ ọtụ nwaanyị nke kacha atọ ya ụtọ ma ọ na-eme aramara, mana ọ bụrụ na e bepụ ya oge a na-ebi nwaanyị ugwu, aramara nwere ike ịbụrụ ya ọgụ na mgba. ""Tupu mụ na di m amalite inwe mmekọ, ahụ ga na-atọ m rịrịrị, mana ngwangwa ọ banyere, naanị ụfụ ka ahụ niile ga na-afụ m,"" Nwa Ibari gwara onye ntaakụkọ BBC. ""Ugbua, m cheta mụ na di m inwe mmekọ, ọ na-amapụ m obi."" Otu 'World Health Organisation' kwuru na ụmụnwaanyị e biri ugwu n'ụwa karịrị nde narị abụọ (200 million). Mana onweghị otu mkpụrụ uru ibi ugwu na-abara ụmụnwaanyị, naanị ọghọm jupụtara ya. Ya mere ha ji wepụta ụbọchị isii nke ọnwa Febrụwarị kwa afọ dịka ụbọchị iji gbaa mbọ maka ịkwụsị ibi ugwu ụmụ nwaanyị. Ọ gaara amasị m ma ọ bụrụ na e bighi m ugwu - Olaedo Nwaanyị ọzọ, Olaedo (ọ bụghị ezigbo aha ya) kọọrọ BBC Igbo etu ibi ugwu si metụta ya. Olaedo kwuru sị: ""Ọtụtụ oge ka ndị enyi m na-ekwu etu aramara si atọba ha n'ụbụrụ, mana ọnaghị ekwe m nghọta."" ""Mana na nke m, tupu mụ anụ ụtọ aramara, nwoke ọ bụ mụ na ya ga-enwe nnukwu ndidi ma were nwayọọ mara ebe o kwesịrị ịkpatụ aka."" Olaedo kwuru na ọ gaara akara ya mma ma ọ bụrụ na nne ya hapụrụ ya etu chi si kee ya, kama ibi ya ugwu. ""Onweghị ihe nwere ike ime ka m bie nwa m nwaanyị ugwu,"" Olaedo kwuru. Mpaghara ebe ibi nwaanyị ugwu ka dị na Naịjirịa Joseph Osuigwe bụ onyeisi otu Devatop Centre for Africa Development kwuru na ọ bụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nakwa Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa ka ụdị ihe a na-emekarị na Naịjirịa. Steeti dịka Ebonyi, mpaghara Okigwe na Mbano n'imo steeti, nakwa mpaghara ụfọdụ n'Abia steeti bụ ebe ọ ka njọ. Ndị ọzọ bụ Ekiti, Ondo, na Osun. Mana Osuigwe kwukwara na ya bụ ihe na-ebelata ugbua, mana ọ kwụsibeghị kpamkpam. �� dị ọtụtụ nkwenye n'omenala dị icheiche nke mere ibi ụmụnwaanyị ugwu ji aga n'ihu.Ha gụnyere: Dịka WHO si depụta, ọghọm ibi nwaanyị ugwu gụnyere: E nwere nkwekọrịta dị icheiche machiri ibi nwaanyị ugwu, nke Naịjirịa so na mba binyere aka na ha. Ha gụnyere:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-55924535 +sports Man City nọ n'ụlọ buru iko Premia Lig Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Man City tukwu n'ụlọ merie Premia Lig Newcastle meriri Arsenal n'asọmpi ya taa N'egwuregwu, Newcastle ji ọkpụ goolu abuo asatara otu (2-1) wee merie Arsenal n'asompi a gbara taa. Arsenal bu uzo nye goolu tupu Newcastle asaa ya, were nyekwa nke ha jiri nweta mmeri na ya bụ asọmpi. Ndị agha oshimiri mba Ghana jidere ụgbọmmiri mmanụ agbịdị ndị Naịjirịa Ndị agha oshimiri mba Ghana akparala ụgbọmmiri ahịaiwu mmanụ agbịdị ndị Naịjiria. Ụgbọmiri ahụ bu mmadụ iri na otu (11) ma burukwa mmanụ ruru metrik tọn narị atọ na iri abụọ (320). Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndị Edo Steeti anwụchiela ndị ọchịehi Aka na-achị steeti Edo bụ Godwin Obaseki, anwụchiela ndị ọchịehị n'obodo abuo na steeti ahụ. Obaseki hibere komitii gbata gbata ga-enyopu ebe ndị ochịehi n'ime ọhia ma kpụgara ha ndị uweojii. Na mba ofesi Onye nnọchite anya US n'ọgbakọ otu mba uwa bụ UN bụ Nikki Haley, ekwuola na mba ha agaghị esi na Syria pụta ma ebum n'obi ha emezughị. Ime ka Syria kwụsi iji ngwọagha kemikal gbuo ndị be ha so n'ihe Nikki Haley kwuru bụ ebumnobi ndị US. Nkeji nke mgbede a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Ihe nkịrị nke taa Ihe onyonyo a gosiri ụmụ Igbo na-agba mbọ na Ladipo, Legos. https://www.bbc.com/igbo/afirika-43770026 +health Elephantiasis: Lee etu anwụnta nwere ike isi butere gị 'ụkwụ aba shoe' Ọrịa Elephantịasis nke a na-akpọkwa 'Lymphatic Filariasis' bụ otu ọrịa na-enye nsogbu na mpaghara Afrịka nakwa Asia. Ndị mmadụ na-eche na ọrịa bụ ọgwụ a gwọrọ agwọ na-ebute ya, mana nnyocha sayensị gosiri na ọ bụ nje a kpọrọ 'Nematodes' na-akpata ya. Nje ndị a bụ 'Nematodes' bụkwa anwụnta na-ekesa ha si n'ahụ otu onye feere onye ọzọ. Mana e nwekwara ụdị ọrịa ụkwụ ọzịza ọzọ a na-akpọ 'podoconiosis' A naghị ahụkarị ụdị nke a kwadaa, kama ihe na-akpata ya abụghị anwụnta. Ọ bụ ihe ọnatarachi dị n'ime ala, nke Bekee na-akpọ 'minerals' na-akpata ya. Mana ọ bụghị nke a ka akụkọ a na-ekwu maka ya. Gịnị bụ Lymphatic filariasis (Elephantiasis) N'ala Igbo, ihe a na-akpọ ọrịa a bụ 'ụkwụ aba shoe', maka na ọ na-eme ka ụkwụ mmadụ zaa azaa. Dịka anyị kọwara na mbụ, ndị mmadụ na-eche na ọ bụ ọgwụ a gwọrọ agwọ na-akpata nke a, mana nnyocha sayensị kọwara na ọ bụghị eziokwu Ọ bụghị anwụnta na-akpata ọrịa 'Elephantiasis' kpọmkwem, kama anwụnta na-ekesa nje na-akpata ya si n'ahụ otu onye feere onye ọzọ. Ụdị nje na-akpata ọrịa 'Lymphatic filariasis' maọbụ Elephantiasis' bụ nke Bekee kpọrọ 'Nematode Worms' maọbụ 'filariae'. Dịka ngalaba WHO si depụta, ụdị anwụnta na-ekesa nje a na mpaghara Afrịka bụ ụdị nke a kpọrọ 'Culex' nakwa 'Anopheles'. Ọ bụrụ na anwụnta a taa onye nwere nje a, ha nwere ike ibufe ya n'ahụ onye ọzọ. Nje a ga-anọzi n'ime ahụ onye ahụ na-abawanye, bịa nọchie ohere ebe mmiri si apụ n'ahụ mmadụ. Nke a ga-eme ka akụkụ ahụ a malite ịza aza. Nnyocha WHO gosiri na ọrịa a na-emetụta ihe ruru mmadụ nde iri atọ na isii (36 million) n'akụkụ ụwa niile, mana ọ ka njọ na mpaghara Afrịka nakwa Asia. Dịka nnyocha nke ngalaba ahụike nke ụlọakwụkwọ 'Stanford University' si gosi, ọrịa 'Elephantiasis' maọbụ 'Lymphatic Filariasis' enweghị ọgwụgwọ ga-eme ka ọ laa kpamkpam. Kama e nwere ọgwụ dị icheiche nke ga-eme ka nje ahụ na-akpata ya ghara ị na-abawanye n'ime ọbara mmadụ. Ọ bụrụ na nje ahụ anaghị amụba, akụkụ ahụ onye ahụ zara aza agaghị na-azawanye. Ọ dịkwa mkpa ka e gbochie anwụnta ịta onye dị nwere ya bụ ọrịa, ka ọ ghara ịtanyekwa nje ọzọ n'ahụ ya. Ihe onye nwere ọrịa a ga na-eme bụ: Dịka ọrịa, 'Elephantiasis', ọtụtụ ọrịa nke anwụnta na-ekesa, enweghị ọgwụ na-agwọta ha kpọmkwem, kama ọgwụgwọ onye ahụ ga na-enweta bụ a gba ekpere chi. Ya mere o ji dị mkpa ka i zeere anwụnta ma chụọ ya ọsọ ụkwụeruala n'okirikiri gị. Ọrịa ọjọọ ndị ọzọ anwụnta na-ekesa gụnyere: Ọrịa amaghị aha ya malitere igbu ọtụtụ mmadụ na mpaghara ụfọdụ n'Enugwu nakwa Delta steeti n'ọdị nso a, mana nnyocha mechara gosi na orịa ahụ bụ ịba ọchananya nke Bekee kpọrọ 'Yellow Fever'. Ọ bụ ụdị anwụ nta a kpọrọ 'Aedes' nakwa 'Haemogogus' na-ekesa ya bụ ọrịa. Kọmishọna Ahụike nke Enugwu steeti, bụ Emmanuel Obi, kọwaara BBC Igbo na ụdị anwụnta a bụ ndị na-efegharị n'oge ehihie. Nnyocha WHO mere gosiri na ọrịa na-egbu ọkara ndị niile butere ya kwa afọ. Ọ ga-ewe ihe dịka abalị atọ ruo abalị isii tupu ọrịa a amalite ịkpa ike n'ahụ onye butere ya, ọ bụrụ na-akpachaghị anya nke ọma, onye ahụ ga-anwụ ma ọ gachaa ihe dịka abalị asaa maọbụ abalị iri. Ọrịa 'yellow fever' na-akpa ike na mba iri anọ na asaa (47) na mpaghara Afrịka nakwa South Amerịka. Onwebeghị ọgwụ e ji agwọ ya kpọmkwem, mana ọ bụrụ na a chọpụta ya n'oge, ndịọrụ ahụike ga na-eleta onye ahụ anya ruo mgbe ọrịa a jiri aka ya laa. Mana oziọma dị na ya bụ na 'Yellow Fever' nwere ọgwụ mgbochi, onye ọbụla gbara ya agaghị arịakwa ya bụ ọrịa ọzọ. Na Naịjirịa, ọ bụrụ na ịgbabeghị ọgwụ mgbochi 'Yellow Fever', ị gaghị enwe ike ime njem gaa mba ọzọ. Ọ bụ n'ahụ Enwe ka a chọpụtara nje a bụ 'Zika' n'afọ 1947 na mba Uganda, mana n'afọ 1952 ka a hụrụ ya n'ahụ mmadụ na Uganda nakwa Tanzania. Ụdị anwụnta na-ekesa nje a bụ nke a kpọrọ Aedes. Mana nwaanyị nwere ike ibufe ya nwa o bu n'afọ, mmadụ nwekwara ike ibute ya site na mmekọ nwoke na nwaanyị. Ọrịa a anaghị emere ụmụnwaanyị dị ime ebere maka na ọ na-eme ka isi nwa amụrụ ọhụrụ pee ezigbo mpe, nke Bekee na-akpọ 'Microcephaly'. 'Zika virus' fesara na mba Brazil n'afọ 2015. Ọrịa a na-emetụtakwa ndị mmadụ ruo taa, mana ọnụọgụgụ ndị ọ na-emetụta pere mpe. Ọrịa ndị ọzọ anwụnta nwere ike ibunye mmadụ gụnyere: https://www.bbc.com/igbo/afirika-55389928 +health Coronavirus: Lee ihe ị kwesịrị ịma maka ọrịa coronavirus Ọrịa Coronavirus bụ ọrịa na-efe efe si n'ikuru ume na-egbu mmadụ. A chọpụtara ya n'obodo Wuhan dị na mba Chaịna. Ọrịa coronavirus na-efe efe site na mmadụ fere na mmadụ. A chọpụtara nke a ka ndị ahụike na-elekọta ndị bu ya butekwara ya. Coronavirus bụ ezinaụlọ nnukwu nje na-ebute ọrịa gụnyere oyi nkịti nakwa ọrịa ndị ọzọ na-akpa arụ. Ọrịa ndị ọzọ si n'ezinaụlọ coronavirus a bụ Sars (si na buusu malite) nakwa Mers (si na Kamel), mana amabeghi ebe nke ọhụrụ a si malite. Olee mba ndị coronavirus metụtara? Kedụ ihe eji amata Coronavirus Ọ na-ebidokarị dịka ahụọkụ na ọkwara ike. O ruo otu izuụka, ọ bido ume obibi (onye ahụ agaghịzị eku ume nke ọma), mgbe ahụ onye ahụ nwere ike ịnọ n'ụlọọgwụ maka ọgwụgwọ. Ọ na-egosịkwa dịka ahụụfụ na ike ọgwụgwụ. Mana onwere ike ịnọrụ izuụka abụọ n'ahụ mmadụ tupu ihe ndị a egosiwa. Ndị na-ahụ maka ahụike na-ekwu ka ndị mmadụ mee ihe ndị a iji gbochie ya bụ ọrịa ruo mgbe a chọtara ọgwụgwọ ya. A ka na-enyocha ihe si n'ahụ ndị na-arịa ọrịa a na laabụ, ịchọpụta ihe kpatara ya na etu e si agwọ ya. Ihe nkiri a maka nwaanyị meriri ọrịa kansa ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51186869 +health Butt Implant: 'Achọrọ m ịwepụ otele m gotere egote' "Sophie Elise bụ nwaagbọghọ dị afọ iri abụọ na anọ nwere agba n'ihe onyonyo na Norway ma nwee ndị nkwado puku narị ise n'elu 'Instagram'. Sophie kọwara na o nwere obere ahụ mana ọ chọro ka e wulite ukwu ya ka ọ dị ka nke 'nwaanyị Owere'. Dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-agbasa iwulite otele dị ka ngwaahịa n'Instagram, Sophie graa mba Tọki ịzụta otele nke ya. O kwuru na ọ na-atụ anya na ọ ga-ada ezigbote ọnụ, mana ha beere ya ezigbo ego nke mere ka obi dị ya mma. ""O bere ego oo, o bere ego karịa ihe ọ kwesịrị ibụ"" ka Sophie gwara ndị mgbasa ozi 'Radio 1 Newsbeat' O kwuru na mgbe a wachara ya otele, na ahụ fụrụ ya ụfụ. Mgbe na-adịghị anya, ndị mmadụ na Soshal Midịa bidoro kwuwe okwu maka otele ya. Ndị mmadụ kwuru na otele ọhụrụ ahụ na ahụ ya agakọghị nke ọma. ""Ugbua ka m matara na ọ bụghị ihe m kwesịrị ime. Ihe niile mere m 'vuum' n'anya, ugbua ka m matara na m echeghị ya ọfụma tupu m waa otele m"" ka Sophie kwuru. Sophie tinyere nke a na-etinye etinye akpọro 'Silicone' mana e nwere atụmatụ ọzọ ebe a ga-ewere abụba dị n'ahụ mmadụ were tinye n'otele ka o buo ibu. Ọ chọpụtala na ahụ ya mara mma ma ghọta na onweghị ihe o ji. Mana ịwepụ otele ya ugbua nwere 'Kọma' Sophie mechazịrị chọta onye dọkita na-awa ahụ nke ọma. Dọkita a kọwaara ya na o nweghị ike ịwepụcha ha niile n'ihi na nke e tinyeere ya bụ nke a na-etinye n'ara. Ọ gwara Sophie na ihe ga-emebi ma e wepụchaa ha niile n'ike. Sophie kwuru na ọ ga-arụzi otele ya n'ọdịnihu, mana ka ọ dị ugbua, ọ ga-ewelata ya ka ọ dịkwa ka ihe yiri anụ ahụ mmadụ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkịrị ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50186048 +sports Norwich City vs Arsenal: Emery alaala mana ihe ji Arsenal ka jisi ha ike O rubeghi abalị abụọ kemgbe ndị isi Arsenal chụrụ onye nkuzi ha bụ Unai Emery mana ha ka jikwa ka ha ji. Nke a pụtara ihe taa dịka ha na otu Norwich City gbara onwe ha onye laba onye laba mgbe ha zutere. Pukki nke Norwich City pịawara goolu mbụ na nkeji 21 nke Aubameyang nke Arsenal sara ya na nkeji 29. Cantwell nyekwara goolu ọzọ na nkeji 45+2 nke pụtara na Norwich city nọ Arsenal n'ihu na ngwụcha agba nke mbụ. Aubameyang gbara penariti nke onye nche otu Norwich chetara na mbido agba nke abụọ. Ogbu opi kwukwara ka agbagharia ya bụ penarịti nke ghọrọla goolu nke abụo nyere ndị Arsenal. Arsenal nwara ike ha ị meri ya bụ asọmpị mana ọ mịtaghị mkpụrụ. Ha ga-ezute otu Brighton n'ụbọchị Tọzde ebe Norwich City ga-ezute otu Southampton. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50624157 +entertainment Ikperikpe ọgụ, Atịlọgwụ, Egedege na egwu ọdịnala ndị ọzọ e ji mara ndị Igbo Iti na ịgba egwu ọdịnala bụ otu n’ime omenala e ji maara ndị Igbo niile, nke ha ji egosi etu obi dị ha kwa mgbe. O nweghi emume ọbụla ndị Igbo na-eme ka egwu ghara ịdị na ya. Etu nnu na-atọ na nri bụ ka egwu dị n’emume ọbụla ndị Igbo na-eme, ọ na-eme ka emume dị ụtọ. E nwere ọtụtụ egwu ọdịnala bụ nke si na mpaghara dị iche iche mejupụtara ala Igbo. Egwu ndị a nwere ụzọ pụrụiche e ji agba ha; ndị e ji ukwu, ụkwụ, aka, obi na akụkụ ahụ ndị ọzọ agba. Akụkọ a ga-eleba anya n’ụfọdụ egwu ndị ahụ nakwa mpaghara Igbo ha si. Ikperikpe ọgụ. Ikperikpe ọgụ bụ otu n’ime egwu ndị e ji mara ndị Igbo nke a na-akpọ egwu agha (iri agha). Ọ bụ naanị ụmụnwoke, ọkachasị ndị agha na-agba ya, ma ha gaa agha merie. A na-eji ụkwụ na obi agba ya bụ egw, onye na-enweghi akpụ obi agaghị agbata ya nke ọma. Onye na-agba egwu a n’Ohafia, Abia Steetị gwara BBC Igbo na tupu nwoke etozuo oke isonye ha na ọ ga-egbute isi mmadụ maọbụ gbaa nnụnụ. Ọ sị na mgbe mbụ na a na-egbu isi mmadụ kama ugbua na bụzi ịgba nnụnụ. Nwoke ahụ gaa n’ọhịa gbata nnụnụ, o were nye nna ya ka ọ gọọ ọfọ, nyekwa nne ya ka o sie ma kee ndị okoroọbịa ibe ya. Obodo ndị e ji egwu a maara bụ ndị si mpaghara Abia North dịka Ohafia, Abiriba, Arochukwu dgz. Nkwa ụmụagbọghọ Nke a bụ egwu ụmụagbọghọ na-alụbeghi di na-agbakaarị. O nwere obodo dị iche iche nwere aha ha na-akpọ ụdịrị egwu. Obodo ndị dị n’Ebonyi steetị dịka Afikpo, Abakaliki bụ ebe ọ kachasị gbapụta ihe na-akpọ ya ‘Ngwa ụmụagbọghọ. Akụkọ kwuru na ọ bụ egwu a ka Uche, bụ nwunye Nnamdi Azikikwe gbara mgbe mbụ o zutere Azikiwe. Mgbe ahụ Uche Azikiwe bụ onye ndu ndị otu egwu ahụ n’Afikpo. Atịlọgwụ Atịlọgwụ so otu n’ime egwu e jiri mara ndị Igbo Otu nwoke na-agba egwu a bụ Akadieze Ambrose gwara BBC Igbo sị na ọ bụ ndị obodo udi na Ezeagu nke Enugwu Steeti malitere ịgba egwu Atịlọgwụ. Akụkọ kọrọ na obodo abụọ ndị a mụrụ ya bụ egwu n'ebe dị icheiche nke gụnyere Awka, n'Anambara steeti n'afọ 1942. Ihe egwu a pụtara bụ ‘e tinyere ya ọgwụ?’ maka etu e si eji ahụ niile ma ụkwụ, aka, isi, agba ya. Atilogwu so n'egwu tuuru ugo n'emume 'Festical of Arts and Culture' (Festac), e mere na Naịjirịa n'afọ 1977. Ambrose sị na a gwara ya bụ egwụ ọgwa tinye ya egwu ọdịnaala ndị ọzọ dịka Ogwurogwu, Ugwuọyakanga, Ọganigwe, na Odegere bụ nke mere ka ọ bụrụ ọpụrụiche dị n'egwu. Ọ bụ naanị ụmụnwoke na-agba ya bụ egwu maka etu ha si efeli elu ma tụgharịa ahụ n’ịgba egwu a. Egwu Egedege Nke a so n’egwu ọdịnala Igbo kachasị gbapụta ihe, nke malitere kamgbe gboo dịka egwu ndị ọzọ. Ọ bụ egwu ọnwa e ji mara ndị nnanna na nnenne ochie nke obodo Unubi dị n’Anambra Steetị. Mmalite egwu a na-abụ opi na ọja, ka ndị otu egwu a ga-eji anabata Ezenwaanyị ha bụ onye na-agụ ma na-agba ya. Ndị ọzọ so n’otu egwu ahụ ga na-ekwe ukwe ma na-agba egwu a. Agaghị akọ akụkọ egwu Egedege ghara ịkpọta aha nwada Theresa Onuorah nke Unubi, bụ onye mere ka ọ bụrụ egwu na-ewu ewu. Egwu Ogene Ogene bụ egwu a ma ama nke a na-eji ezi ikike dị mmadụ n’ahụ agba, onye erighi nri agaghị agbanwu ya. A kpọrọ ya ‘egwu ogene’ maka na ogene bụ isisekpu ntị na ya bụ egwu. Nke ahụ apụtaghị na ọ bụ naanị ogene ka e ji eti ya, ngwa egwu ndị ọzọ e ji na-etinye nnu na ose n’egwu a gụnyere, ogene, ọja, ọyọ, ịchaka, udu, ekwe dgz. A na-ehudata ala, were mkpịsị ụkwụ sọnye n’ala dịka a na-agba egwu a. Obodo ndị nọ n’Anambra nakwa Enugwu bụ ndị na-agbakaarị egwu a. Abigbo Mbaise Dịka aha ha si dị ọ bụ egwu e jiri ndị obodo Mbaise dị n’Imo Steeti bụ nke malitere kamgbe agb��rụ ha bidoro. Otu onyeisi egwu a bụ Chukwudi Amaefule gwara BBC Igbo na ọ bụ egwu e ji emebọ ihe mere arụ n’obobo. Na ọ bụrụ mmadụ mee arụ, na ndị Abigbo ga-apụta gụọrọ onye ahụ egwu ikpe ma kpọpụta aha ya ka ọha mere. Ọ bụ naanị ụmụnwoke aka ha dị ọcha, na-anaghị ezu ohi, egbu mmadụ, agwọ ọgwụ nwereike isonye n’Abigbo. Ndị otu  egwu a na-ama akwa jọọjị n’ukwu, yiri uwe ọcha n’elu ma were ukwu na-agba ya bụ egwu. Ha na-enwe onye ọbụ abụ na ndị ukwe abụ. E nwekwara ọtụtụ egwu ọdịnala ndị ọzọ Igbo nwere gụnyere; egwu ekpiri, egwu ụbọ, ịgba ndị Eze, egwu mmụọ, ọmụrụ ọnwa dgz. https://www.bbc.com/igbo/articles/c3gwrgqvedjo +politics Xi Jinping: Ihe ị kwesịrị ịma maka onyeisiala mba China Aha Xi Jinping bụ aha ọtụtụ ma ama n’ụwa dịka ọ bụ onyeisiala mba Chaịna kemgbe afọ 2012. Xi gbara afọ 69 bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị nọ n’ọkwa ọdeakwụkwọ ukwuu nke otu pati Chinese Communist Party (CCP) nakwa onyeisioche Central Military Commission (CMC). Ọtụtụ mba ụwa dị icheiche na-akwanyere Xi Jinping ugwu dịka onyeisiala mba so na mba ndị kachasị ike n'ụwa. N'ime mba 193 dị n'ụwa, Chaịna na mba 178 nwere mmekọrịta azụmahịa; onweghị mba ọzọ nweruru otu a. Mana n'ọdị nso, a na-ebo Xi Jinping ebubo aka ike na mmekpa ahụ megide ndị agbụrụ Uyghur, Kazakh, Kyrgyz, na ndị okpukperechi alakụba na mba Chaịna. Kama ọ gọrọ agọ banyere ebubo ndị a. Xi Jinping nwere nnukwu mmasị n'ebe Afrịka nọ, nke mere mba Chaịna ji enye ọtụtụ mba Afrịka ihe enyemaka dị icheiche n'ụdị mgbazinye ego, ịrụrụ ha okporo ụgbọoloko, maọbụ ọdọ ụgbọelu na ihe ndị ọzọ. Naanị otu mba n'Afrịka jụrụ ka ha na Chaịna nwee mmekọrịta azụmahịa, mba ahụ bụ Eswatini. Afrịka so n'otu mpaghara ebe mba Chaịna kacha ere ngwaahịa dị icheiche ha na-arụpụta. Ọ bụ Chaịna rụrụ isi ụlọọrụ otu jikọrọ mba Afrịka niile bụ African Union, nke dị n'Addis-Ababa Ethiopia, ma nye ya Afrịka dịka onyinye. Ọnụego e ji rụọ ya bụ ụlọ bụ narị nde dọla abụọ (US$200). N'aka nke ọzọ Chaịna na-esi n'Afrịka azụta mmanụ agbịdị, kọtịn, Iron ore na ihe akụ ọnatarachi ndị ọzọ. Mba Saụt Afrịka, Ethiopia, Angola na Naịjirịa bụ mba Afrịka ha na Chaịna kacha azụkọrịta ahịa. https://www.bbc.com/igbo/articles/cjqvgvjx7xgo +business Akụkọ Kachasị n'ụtụtụ a: G7 ewepụtala $3b ị kwalite ụmụnwaanyị Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a Minista na-ahụ maka ihe gbasara mmanụ agbidi bụ Ibe Kachikwu ekwuola na Gọmentị etiti ga-emezu nkwa ha kwere ndị Naịja Delta n'ihe gbasara nchekwa obodo ha Nke a bịara ebe ndị ntorobia ahụ na-ebo ndịagha Naịjirịa kwesiri ị chekwa ha ebubo ohi mmanụ agbidi. Ọzọ na Naịjiria Lagos steeti na steeti ndị ọzọ dị na ọdịda anyanwụ Naịjirịa etinyela ụbọchị iri n'abụọ nke ọnwa Juun dịka ụbọchị ezumike. Akwukwo e depụtara gbasara iwu a, nke gọvanọ Ambode binyere aka na-ekwu na ọ bụ iji kwanyere ụbọchị onyekwuoucheya ugwu o kwesiri. Ijeri dọla atọ maka ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị Lee ebe Malala Yousafzai gosiri nkwado ya maka okwu a na soshal midia. Mba Canada na mba ndị ọzọ nọ n'otu G7 ekwela nkwa ị wepụta ijeri dọlla atọ ị ji hụ na ụmụnwaanyị nwereike gụọ akwụkwọ dị ka ibe ha. Ego a ga-akwalite ngalaba ọgụgụ akwụkwọ na mba dị ịccheiche n'ụwa niile kachasi ebe ndị e nwere ọgbaghara . N'Egwuregwu, Otu bọọlụ mba Kamerun akpọrọ Lioness ejila ọkpụ iri asataghị otu merie otu bọọlụ mba Congo n'asọmpị ha gbara. Nke a mere na Lioness etozuola ị sonye n'asọmpị nke iko mba Africa ụmụnwaanyị. Gee nkeji nke ụtụtụ a: https://www.bbc.com/igbo/afirika-44429091 +sports Women's World Cup: Super Falcons e jizi otu ụkwụ kwụrụ? "Goolu abụọ nke Ajara Nchout nyere na nkeji 95 bu nke bufere Cameroon kpam kpam n'agba nke abụọ asọmpi a. Nchout bu onye nyere goolu mbu na nkeji 57 nke mba New Zealand satara ha. Etu asọmpi si metụta Naịjirịa bụ na mba Chile kwesiri imeri mba Thailand tupu Falcons anafere. Ugbua, ọ bụzị ngụkọ goolu bụ goal aggregate na Bekee ka a ga-eji ma onye meriri. Igwe mmadụ akụola ndị ohi na-anapụ mmadụ akpa dukaduka n' Enugu Ndị mmadụ ewerela iwe kụọ ndị e chere na ha bụ ndị ohi akpa ike n'okporo ụgbọoloko dị na mpaghara Holy Ghost, Enugwu, ọkwụrụ n'anya ụbọchị Tuuzde. Ndị a bụ so n'otu ndị e chere na ha ji egbe na ngwaọgụ ndị ọzọ anapụ ndị mmadụ akpa na ihe dị mkpa na akụkụ ahụ. Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amaraizu si kọwara BBC Igbo, ọ bụ oge ndị omekome a napụchara otu nwaanyị akpa ya n'ike ka ndị mmadụ zuru ha n' ahụ kụọ ha ihe tinka kụrụ pan. ""Ndị a bụ ndị na abụ ha hụ mmadụ, ha lee anya,lee anya, ha anapụ gị akpa gị."" ""Ndị ọrụ anyị nwetara mkpesa na ndị ohi napụrụ nwaanyị agba ya. Ndị ọrụ anyị yi akwa nkịtị chụwa ha ọsọ, ha agbaba ọhịa mana ndị mmadụ nyere aka chụwa ha jide ha kụọ ha ihe. ""Mgbe ndị uweoji a kpọrọ ka ha bịa nyere aka rutere, ike akwụla otu, e buga ya ụlọọgwụ , ebe dọkịta kwuru na ọ nwụọla."" Amaraizu onye kwuru na ha napụtara ha mma nakwa ihe ndị mmadụ ha zutere, gara n'ihu kwuo na onye nke ha ji aka na-enyere ha aka na nchọpụta. Otu nwaodibo aha ya bụ Joseph Ogbu ewerela mma sugbuo nne ya ukwu nakwa nne nne ya ukwu n'ụbọchị Tọọzde. Nke a mere naanị abalị abụọ e wechara ya n'ọrụ na mpaghara Surulere na steeti Legọs. Ogbu onye Benue steeti malitere ọrụ n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Juun. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Legos bu Bala Elkana gwara BBC Igbo na ha anwụchiela nwata nwoke ahụ. Dịka Elakana si kwuo, ""Ogbu kwuru na nne ya ukwu kpasuru ya iwe o wee sugbuo ya."" Ọ sịkwara na ọbughị ya gburu nne nne ya ukwu, kama ọ gharịpụrụ nwụọ mgbe ọ hụrụ na nwa ya anwụọla. Aha nne ya ukwu bu Oreoluwa John, ebe nke nne ya bu Adejoke John. Ha gbara afọ iri atọ na asatọ na iri asatọ na itoolu n'otu n'otu. Ndi uweojii kwuru na ha ka na-enyocha ya bu okwu iji matachaa ihe nile merenụ. Gọọmentị Naịjirịa agbaghala okwu na-efegharị na onyeisi NNPC ọhụrụ bụ Mele Kyari so n'ezinaụlọ Abba Kyari. Cheta na ọ bụ taa ka gọọmentị Naịjirịa kpọpụtara aha Mele Kyari dịka onyeisi ọhụrụ ngalaba na-elekọta mmanụ ụgbọala Naịjirịa bụ NNPC. Puku mmadụ ole na ole abanyela okporoụzọ ime ngagharịiwe na mba Malawi maka mpụtara ntuliaka e mere n'ọnwa gara aga. Ha na-akpọ oku ka onyeisi ngalaba ntuliaka na mba ha ritue n'ọkwa. Aka na-achịkọta otu Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na o kwenyesiri ike na otu ya ga-ebulata iko mba Afrịka n'ihi na e nwere ndị ọgba bọọlụ ochie ụkwụ kara aka nakwa ndị ọhụrụ. Onyeisiala Muhammadu Buhari enwepụtala Mele Kyari dịka onyeisi NNPC. Kyari ga-amalite ọrụ ya n'abali asaa nke ọnwa Julai. Maikanti Baru bụ onye ji ya bụ ọkwa kemgbe 2016 ga-ala ezumike nka. Kyari na-anochite anya Naịjirịa na Organisation of Petroleum Exporting Countries (OPEC). Ọ gụrụ ihe banyere ala, nke Bekee kpọrọ ""Geology"" na mahadum ma nọrọ isi OPEC economic commission board. Akwụkwọ na-akọwa na-ọbụghị nwanne Abba Kyari - bụ onye aka nri Onyeisiala Muhammadu Buhari - agbanyeghị na ha na-aza otu aha nna. Gọmenti etiti ekwuola na eziokwụ atọgbọghị na kepukepu na-efegharị na ọrịa Ebola abatala na Naịjirịa ọzọ. Onye kwuru nke a bụ odeakwụkwọ ukwu ụlọọrụ na ahụ maka ahụike bụ Abdullaziz Abdullahi bụ onye sị na kemgbe 2012 na ọnwebeghị onye ahụrụ bụ ya bụ nje na Naịjirịa. Gọmenti etiti ekwuola na eziokwụ atọgbọghị na kepukepu na-efegharị na ọrịa Ebola abatala na Naịjirịa ọzọ. Onye kwuru nke a bụ odeakwụkwọ ukwu ụlọọrụ na ahụ maka ahụike bụ Abdullaziz Abdullahi bụ onye sị na kemgbe 2012 na ọnwebeghị onye ahụrụ bụ ya bụ nje na Naịjirịa. N'ofesi, Ndị agha Iran ekwuola na ha gbatụrụ drone mba US ji enyopu ihe na-eme na Iran. Mana ndị US ekwubeghị ka nke a bụ eziokwu ka ọ bụ eziasị. N'asọmpi agbara ụnyaahụ, otu egwuregwu bọọlụ Smart City nke Legọs ji ọkpụ gọọlụ atọ asatara abụọ chụpụ Enyimba nke Aba na Iko Aiteo Federation Cup. Rivers United ji ọkpụ atọ chụpụ Akwa united. Rangers na Nassarawa United sokwa na ndị akupụrụ na ya bụ iko Aiteo Gee nkeji anyị ebe a" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48702083 +health Coronavirus and Lassa Fever: Ihe ị ga-eme ma etinye gị na 'quarantine' n'ihi ọrịa ndị a Kamgbe ọrịa coronavirus tịpụtara isi, o dosala ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnọdụ nyocha ebe ha na ndị ọzọ anaghị enwe mmekọ. Ụfọdụ n'ime ndị a bụ ndị buterela ọrịa a ebe ndị ọzọ ka na-enyocha ma ọrịa a onwereike igosipụta n'ahụ ha. Ọ na-adịkarị ndị nọ n'ọnọdụa ka ụwa ọgwụla dịka nwata akwụkwọ Naịjirịa bi na Wuhan Chaịna ebe coronavirus malitere si kọọrọ BBC Igbo. Nwa akwụkwọ a bụ onye hụtara onwe ya n'ọnọdụ a kpọrọ 'House quarrantine' sị na ọ na-emetuta ya n'ụbụrụisi. Otu onye dọkịta bụ Mcginger Ibeneme gwara BBC Igbo ụfọdụ ihe ndị hụrụ onwe ha n'ọnọdụ a ga-eme. Ihe ha ga-eme gụnyere: Dọkịta Ibeneme sị na onye dị etu a kwesịrị i na-emega ahụ kwa ụbọchị o tetere n'ụra ka ahụ ya na-esi ike. Ọ gara n'ihu kwuo na onye ahụ ga-agba mbọ na-ezu ike nkeọma. Onye ahụ ga na-eme ihe dịka ikiri TV, ịgụ akwụkwọ, ị pịị ekwentị ya bụ ihe ndị ga-akpọpụ uche ya n'ọrịa a. Nke kachasị nke bụ na onye ahụ ga-enwe echichie ọma mara na ọnọdụ ọ nọ n'ime ya bụ nwa mgbe nta ka ọ ga-ebi. Onye a gaa na-ege ntị n'akụkọ ka ọ mara etu ihe si a aga, ọ ga na-ekpe ekpere nakwa ime onwe ya obiụtọ. Dọkịta Ibenema gara n'ihu kwuo ka onye dị etu a ghara ịhụta onwe ya dịka onye agbahapụrụ. Kama ka ọ mara na ọ bụ maka ọ dị mma nke ya nakwa nke mba niile butere e ji tinye ya n'ọnọdụ ahụ. 'Obodo Wuhan dị ka ịkpa a na-eli mmadụ' - Nwata akwụkwọ Naịjirịa Gọọmentị Anambra agbapeela Ahịa 'Electronics' Nnewi BBC Igbo agbaala afọ abụo... Ụnụ aṅụla ngwọ na nkwụ na-abịa https://www.bbc.com/igbo/afirika-51572006 +politics Nnamdi Kanu Terrorism trial: Onyeisi otu IPOB agbaala akwụkwọ ọhụrụ ịjụ ka e kpee ya ikpe na nzuzo "Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu agbaala akwụkwọ n'ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja ịgbagha atụmatụ ọhụrụ Ụlọikpe Ukwu Etiti wepụtara nke kwuru ka e kpee ya ikpe na nzuzo. Cheta na Gọọmentị Etiti nwụchiri Nnamdi Kanu na mba Kenya n'ọnwa Juun afọ 2021, kpụlata ya Naijiria ma kpụpụ ya ụlọikpe ebe a na-ekpe ya ikpe maka ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị na iyi ndụ egwu. Na nsonso a, Ọkaikpe Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja bụ Jọstis John Tshoho wepụtara akwụkwọ usoro a ga na-agbaso n'ikpe metụtara iyi ndụ egwu a Naijiria bụ nke machiri ịgbasa ozi maka etu ikpe si aga n'ụlọikpe. Mana n'akwụkwọ nke Kanu gbara site n'aka Ọkaiwu ya bụ Ifeanyị Ejiofor ụbọchị Monde, ọ rịọrọ ka ụlọikpe kpebie na atụmatụ ọhụrụ ahụ Tshoho wepụtara megidere Iwu Naijiria nke afọ 1990 ma kagbuo ya.. Kanu bụ onye kpọnyere aha Jọstis John Tshoho, na onyeisi nhazi ụlọikpe(Chief Registrar) na ndị ọ gbara akwụkwọ chọrọ ka a machie ha na ndị na-agara ha ozi maọbụ na-anọchite ha na ndị ọrụ ụlọikpe Ukwu nke Etiti itinye usoro ọhụrụ ahụ n'ọrụ rue ebighị ebi. Akwụkwọ ikpe ahụ rịọrọ ka Ụlọikpe Ukwu nke Etiti kwupụta, ""na ikike nke onye mbụ (Ọkaikpe) nwere n'Iwu Naijiria Akụkụ nke 254 bụ sọ naanị n'ime ogige Ụlọikpe, ọ bụghị na gburugburu ya nke bụ oke na ọrụ ndị ọrụ nchekwa dịka ndị uweojii, ndị uweojii nzuzo(DSS) wdg. Ihe ọzọ Kanu rịọrọ bụ "" ntụzịaka nke ga-ekwupụta na Usoro Iwu nke Uloikpe Etiti dịka o si metụta ikpe iyi ndụ egwu megidere Iwu Naijria, ya mere na ọ gaghị adị ire."" N'aka nke ọzọ, Ejiofor gakwara zute Nnamdi Kanu n'ogige ndị DSS n'Abuja taa bụ Monde ma gbaa ama na ya na Kanu '""lebara anya n'ụsoro ikpe ha ga-eji akụpụ kpamkpam ebubo asaa ndị fọrọ a ka na-ebo ya"" Ejiofor gara n'ihu sị, ""Onye ndu kelere Ụmụ Chineke maka nkwudosi ike ha. Obi dị ya ụtọ na ụnụ ji nghọta na otu obi na-aga"". "" Onyendu kwusiri ike maka ike nkwụcha ọkachasị n'oge dịka ugbua , na-agbanyeghị nkusu nile a na-akusu ụnụ."" ""Ọ sị ụnụ jisie ike n'ekpere na ịrịọ Chukwu Okike Abiama."" Nnamdi ""Nwannekaenyi"" Kanu hibere ma bụrụ onye ndu otu a ma dịka Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2012. Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kewapụ na Naịjiria ma bụrụ mba a kpọrọ Biafra. Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra, mana ka a lụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru otu nde, atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu. Kanu malitere Redio Biafra nke e hibere na London n'afọ 2009 ma na-agbasa ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa. N'afọ 2018 ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu." https://www.bbc.com/igbo/61217847 +politics Biodun Oyebanji nke APC emeriela ntuliaka gọvanọ n'Ekiti Steeti "Inec akpọpụtala aha Biodun Oyebanji, nọ na pati 'All Progressives Congress' dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere n'Ekiti steeti n'ụbọchị Satọde. Oyebanji nwetara vootu ọnụọgụgụ ya dị 187,057 iji turu ugo na ya bụ ntuliaka. Onye gbara onye nke abụọ na ntuliaka a bụ Mazi Segu Oni nke 'Social Democratic Party (SDP), onye nwetara vootu 82,211. Bisi Kolawole nke Peoples Democratic Party (PDP) gbara onye nke atọ dịka o nwetara vootu 67,457. Ekiti steeti nwere okpuru ọchịchị iri na isii, mana Oyebanji meriri ntuliaka n'okpuru ọchịchị iri na ise n'ime ha. Ngụkọ vootu ebidola dịka emechara ntulika ọkwa Gọvanọ n'Ekiti steeti n'ọtụtụ polling unit n'ebe ahụ. BBC hụrụ ebe a na-akpọpụta mpụtara n'otu ebe bụ 'Dallimore street'. Site n'ihe a na-akpọpụta, ọ dịka otu APC a na-emeri mana INEC akpọpụtabeghi ezi mpụtara ya. Cheta na ndị mmadụ tụchara vootu ha jụ ịla be haa ma nọrọ ala na-eche mgbe ngụk��� ga-amalite iji chekwa vootu ha. A tụchaala vootu n'ụfọdụ 'polling unit' dị n'Ekiti dịka onye ntaakụkọ BBC Igbo si chọpụta. Na polling unit dị na gburugburu Okosa, ọtụtụ ndị tụrụ vootu ka nọ na-eche ka a gakọọ vootu ha ọnụ Otu onye bụ Ogbonnaya Isaac sị ""Aga m eche mara ma ọ bụ pati m tụụrụ vootu ga-emeri n'ebe a."" Kepukepu ọzọ onye ntaakụkọ BBC Igbo nụrụ bụ na o nwere ndị na-enye ego iji zụrụ vootu ndị mmadụ. Ọ sị na ọgbaghara dapụtara n'ebe a kpọrọ 'bank road' mgbe otu nwokorọbịa setere ndị na-azụ vootu foto nke mere ha jiri chụwa ya ọsọ. Nwokorọbịa ahụ gbabara n'aka ndị nchekwa mana ha mechara tọhapụ ya. Ndị steeti Ekiti apụtara n'igwe ma malite ibinye aka n'akwụkwọ ntuliaka iji họpụta Gọvanọ ga-achị ha ruo afọ anọ ọzọ. Ụfọdụ ebe ndị a onye ntaakụkọ BBC Igbo gara dịka 'polling Unit ndị dị n'Ado Ekiti, ndị mmadụ na-enyocha aha ha. Ebe ndị ọrụ Inec buputara ngwaọrụ ha ma tụziere ndị mmadụ aka etu ha ga-esi binyeaka. Ọtụtụ ndị mmadụ pụtara kwụrụ chịm n’ogige ‘polling unit’ bụ ebe ha ga-ebinyeka. N’ihe dịka elekere asaa nke ụtụtụ, ụfọdụ ndị ọrụ Inec a kpọrọ ‘adhoc staff’ apụtala n’ogige ndị a na-akwado maka ntuliaka. Ụlọorụ Inec adịla mbụ kesaa ngwa ọrụ ndị e ji eme ntuliaka gawa n’okpuruọchịchị dị iche iche. Taa bụ Satọde, abalị iri na asatọ nke ọnwa Jun 2022, ka ndị Ekiti Steeti ga-ahọpụta Gọvanọ ọhụrụ ga-achị ha ruo afọ anọ ọzọ. Ngalaba nhazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) ekwuola na ha dị njikere maka ya bụ ntuliaka. BBC Igbo kwụ chịm n'Ekiti Steeti iwetara gị etu ya bụ ntuliaka si aga. Inec ekesachaala akụrụngwa niile dị mkpa maka ntuliaka a, ọtụtụ n'ime ndị ọrụ ha anọrọkwala n'ebe dị icheiche e zigara ha. Ntulaiaka ga-amalite kpọmkwem n'elekere asatọ nke ụtụ. N'aka nke ọzọ, ndị ọrụ nchekwa ekeela ajị n'ume ma jikere maka ntuliaka a." https://www.bbc.com/igbo/articles/c2q54pl1rr6o +health Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Ihe ọgwụ ike codeine na-eme ndị ntoroọbịa Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a Ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ na Nigeria bụ Emzor achụọla otu onye oreeahịa ha ma kwụsị mmadụ abụọ ọrụ n'ike n'ihi aka ha tinyere n'ire ọkwụ ụkwara,codeine, n'ụzọ megidere iwu. BBC malitela ụbọchị Tuusde ngosi ihe onyonyo ha mepụtara nke na-egosi mkpamkpa iṅụbiga ọgwụ ụkwara codeine oke na-eme na ndụ ndị ntoroọbịa. A malitere ihe ngosi a na Sheraton Hotel Ikeja, Legos, ụnyaahụ dịka ozi na-ekwu na achụọla onyeisi azụmahịa ụlọọrụ Emzor Pharmaceutical ndị aka na-arụ n'akụkọ ahụ. N'akụkọ ọzọ... Dika taa bụ ụbọchị ncheta ndịọrụ bekee n'ala Naịjiria, onyeisi ndị Nigeria Labour Congress NLC bụ Ayuba Wabba, ekwuola na ha agaghị ekwe ka kọmitii ahụ ehibere maka ileba anya n'ụgwọọrụ opekatampe ndị ọrụ bekee dọghachị aka elekere azụ n'imejupụta nkwa ahụ. Wabba kwuru nke a n'emume ha kpokobara ndị ọrụ na Abuja ụnyaahụ. Na mba ndị ọzọ: Ndị United Kingdom akwadola amụma nke ndị Iran n'agbanyeghị na US na Isreal hụrụ aka enwe na ya bụ ofe. Israel mere ihe ngosi iji kwuo na Iran ji ụzọ aghụghọ etinye aka n'ịrụputa ogbunigwe nuklea nke ndị Iran na-agọ. Gee nkeji nke mgbede a ebe a: Ihe onyonyo nke taa: https://www.bbc.com/igbo/afirika-43959663 +health Ị ma na ịgbọ ncha nwereike ime ka utu gị ghara ị na-ekeli ọsịsọ? "Mmadụ imetu onwe ya aka maọbụ ""ịgbọ ncha"" bụ otu okwu ndị mmadụ anaghị ekwukarị maka ya. Ọ bụghị naanị ndị Afrịka ka okwu a na-anyị arụ ikwu, o nwere agbụrụ ndị ọzọ dịka ndị India nakwa ndị Chaịna anaghị ekwu maka ya. O nwereike ịbụ n'ihi na ụfọdụ ndị mmadụ chere na ọ bụ ihe ọjọọ maọbụ na ọ bụ ihe atịtị. Mana o nwere uru dị na ya? Lekwa ihe anyị chọpụtara: Cynthia Fogoe bụ ọkachamara n'ihe gbasara mmkeọahụ chere na o nwere ụfọdụ uru. Ọ gwara BBC Radio na mkparịtaụka ha nwere na uru dị na mmadụ ""ịgbọ ncha"". Lee ihe ndị o kwuru ebe a: Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ Chidinma Njoku bụ onye ọrụ ahụike. O kwuru sị ""Ọ bụ ụzọ ị ga-eji mụta maka ahụ gị"" ma kwukwaa na: Ọghọm dị n'ịmetụ onwe gị aka Fogoe gaara n'ihu kọwaa na o nwere ọtụtụ ọghọm sikwa n'ịgbọ ncha pụta. O kwuru na ọ na-arara ọtụtụ ụmụnwoke na-eme ihe a ahụ ịnọte aka ma ha na onye ọzọ na-enwekọ aramara. ""Ị na-eme ihe a mgbe niile, ị ga-akuziri ụbụrụ gị na ọ bụ naanị n'ụzọ ịgbọ ncha ka ị ga-esi nyụọ uhie"". Nke a ga-ebute nsogbu dịka, enweghi ike ikeli utu gị, ịnyụ uhie ọsịsọ, ịnọte aka n'aramara tupu ị nyụọ uhie. Nnyocha ọzọ gosiri na ikiri ihe onyonyo aramara bụ ""pornography"" na Bekee nke na-eso ịgbọ ncha, na-emetụta ụbụrụ mmadụ n'ụzọ ọjọọ. Ọ na-eme ka ndị na-ekiri ya kwụsị ịnwe agụụ mmekọrịta n'ebe nwunye maọbụ enyi ha nwaanyị nọ. Ụfọdụ na-eche na ekwute okwu mmadụ igbo onwe ya agụrụ mmekọahụ, ọ bụ ụmụnwoke ka a na-ekwu maka ha. Mana Radhika Sanghani bụ onye ntaakụkọ ma maka aramara kwuru na nke a bụghị eziokwu. Sanghani kwuru na ""ụmụnwaanyị na-eme ya mana ọ bụghị ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya chaa chaa"". Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-53797432 +politics P&ID Nigeria: Malami, Lai Mohammed, Emefiele agaala ikpe udo na UK Ndị nnọchite anya gọọmentị etiti awụchiela na mba UK maka okwu gbasara akwụkwọ ụlọọrụ P&ID gbara Naịjirịa na-asị ka a kwụọ ha ijeri naịra itoolu na ụma. Okaiwu ukwu nke gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami, Mịnịsta mgbasa ozi bụ Lai Mohamed, na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu so wee mee njem a. Ndị ọzọ gụnyere onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele, osote onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Lmorde, na onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka (EFCC) bụ Ibrahim Magu. Ha gara ịmata ka a ga-esi jiri nwayọ dozie esemokwu dị n'etiti gọọmentị na ndị P&ID. Njinji ejiela n'obodo Eliza dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ime njem a kpọrọ Thomas Cook pịachiri ọrụ n'ụbọchị Mọnde. Ụlọọrụ Thomas Cook nke malitere kamgbe afọ 1841 so n'otu ụlọọrụ a ma ama maka ịhaziri ndị mmadụ njem ụgbọelu ha. Ọ dị ọtụtụ ihe mere ka ya bụ ụlọrọụ pịachie mana nke bụ isi sekpụ ntị bụ okwu ego. N'ọnwa Mee afọ a, ụlọọrụ Thomas Cook kwupụtara ọghọm ruru otu ijeri paụnd na ụma ise (£1.5 billion). Mbọ ikpeazụ ụlọọrụ ahụ gbara ka ha mara ma gọọmentị a ga-agbazinye ha ego dị narị nde paund abụọ na iri ise (£250 million) kụrụ afọ n'ala. Nke a mere ka ụlọọrụ ahụ kubie. Onyeisi ya bụ ụlọọrụ bụ Peter Fankhauser kwuru na mmechi ha wutere ya n'obi nke ukwuu. Mmechị ụlọọrụ ahụ ga emetụta ọrụ ndị mmadụ ruru puku iri abụọ na abụọ nke puku itoolu n'ime ha bụ ndị mba UK. Ndị dibia bekee na-arụ ọrụ na Abia State University Teaching Hospital eribeghi ụgwọ ọnwa kamgbe ọnwa iri na atọ gara aga. Nnamdi Irondu bụ ọnụ na-ekwuru otu jịkọrọ ndị dibia bekee ahụ gwara BBC Igbo na ha-agbaala abụbụ ọrụ ugboro ugboro mana nke ahụ emeghi ka ọnọdụ ha gbanwee. BBC Igbo kpọtụụrụ onye kọmishona na-ahụ maka mgbasa ozi n'Abia Steeti nakwa onyeisi ọrụ ntaakụkọ gọvano Okezie Ikpeazu bụ Onyebuchi Ememanka ka ha tinye ọnụ n'okwu ahụ mana ha azabeghị anyị ruo ugbua. Onye nkuzi ndị otu bọọlụ Barcelona bụ Ernesto Velverde chị obi n'aka ugbua n'ihi ọnyụpa ndị otu ya na-agba. Barcelona bụ ndị nke asatọ na tebulu La liga ugbua nke mere ka ndị mmadụ na-ekwu na a ga-achụ Velverde n'ọrụ. Gee nkeji ebe a: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-49804085 +politics Ihe ọhụrụ Nnamdi Kanu, Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor kpara n'ụbọchị Mọnde "Onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) bụ Nnamdi Kanu agwala ndị nkwado ya ka ha bilie buo agha megide ndị na-eji aha ndị Ipob na-eme arụ dị icheiche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ. Kanu kwuru nke a oge ndị ọkaiwu ya bụ Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor gara hụ ya n'ụlọ mkpọrọ ndị 'Department of State Services' (DSS) n'ụbọchị Mọnde, Disemba 5, 2022. Cheta na ndị DSS jichiri Mazi Kanu na mkpọrọ kamgbe ọnwa June 2021 oge a nwụchiri ya na mba Kenya ma kpụlata ya Naịjirịa. Ejiofor kwuru na Kanu gwara ndị nkwado ya ka ha gbado anya maka ndị ekperima na-eji aha ndị Ipob na-eme arụ dị icheiche dịka ịtọrọ mmadụ maka ego, igbu mmadụ nakwa izu ohi. Dịka Ejiofor si kwupụta n'akara Twitter ya n'abalị Mọnde, Mazi Nnamdi Kanu nyere ndị nkwado ya ndụmọdụ ka ha ghara inye ohere ka ime mpụ bụrụ ihe e ji mara ndị Ipob. ""Onye ọbụla na-amanye ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ bụ onye iro nke mbụ nye Onyendu Nnamdi Kanu,"" Ejiofor dere. ""Onyendu enyeghị iwu ọbụla ka ndị mmadụ na-anọ n'ụlọ na mpaghara Biafra. Ndị be anyị ga na-agara mkpa ha oge niile iji hụ na ọnọdụ ndụ na akụnụba ndị be anyị guzosiri ike."" Cheta na ndị Ipob tinyeburu iwu ịnọ n'ụlọ iji gosi iwe ha maka etu gọọmentị Naịjirịa si jichie Mazị Kanu. Ọ bụ eziokwu na Ipob kwuru na ha ewepụla iwu a ugbua, mana ụjọ anaghị ekwe ndị mmadụ pụọ iro n'ụbọchị Mọnde ọbụla na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dị icheiche, n'ihi na ụfọdụ ndị ekperima awakpola ndị mmadụ n'oge gara aga n'ihi na ha pụtara ezi n'ụbọchị Mọnde. Ejiofor kwuru na Nnamdi Kanu dọrọ ndị nkwado ya aka na ntị ka ha kpachapụ anya, maka na ndị ekperima a na-awakpo ndị mmadụ na-eyi ha egwu bụ ndị iro ya, ndị chọrọ ka gọọmentị na-ebo ya ebubo ihe ọjọọ niile a ha ji aha Ipob eme. ""Ịtọrọ mmadụ na ime mpụ bụ nnukwu arụ n'omenala anyị dịka ụmụ Chineke, onye ọbụla na-etinye aka na ya bụ onye iro Onyendu Nnamdi Kanu nakwa onye iro Igbo niile... Ozuola bụ na Ozuola bikonu,"" Ejiofor kwuru. Cheta na ndị ọrụ nchekwa ebola ebubo ugboro ugboro na ọ bụ ndị Ipob nakwa ndị ọgụ ha bụ 'Eastern Security Network' (ESN) na-akpa ike ọjọọ dị icheiche nke mere ka ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'ọdị nso a. Ha kwukwara na ọ bụ ndị Ipob/ESN wakporo ụlọ mkpọrọ dị n'Owerri n'afọ 2021 ma tọhapụ ọtụtụ ndị mkpọrọ, bụzị ndị na-awakpo ndị uweojii na ndị agha na mpaghara ahụ. Mana ndị Ipob ekwuola na aka ha dị ọcha n'ebubo niile ndị ahụ." https://www.bbc.com/igbo/articles/cpd2jz0zm2lo +religion Akụkọ kachasị n'ụtutu a: CAN akagbuola ngagharị iwe ha hibere "Akụkọ ndị dị mkpa n'ututu a Sinetọ Dino Melaye emeela ihe e ji kpụrụ ya n'ọnụ ọzọ. Dino Melaye etiela egwu ọzọ ebe ọ jara otu pati PDP mma na-asị na ọ chọrọ ịlaghachị, ma kwuo na APC ataala ya ahụhụ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Dino Melaye: Onye omeiwu ukwu etiela egwu ọzọ Ngalaba a kpọrọ Nigerian Supreme Council of islamic affairs agwala gọọmentị etiti ka ha gbaa mbọ hụ na nchekwa ruru ime obodo, maka ogbugbu mmadụ na-eme na Naịjirịa, ma na-akatọ okwu dị iche iche ndị ụkọchukwu na-ekwu maka ya. Nke a na-eme ka ndị otu Christian Association of Nigeria kagburu ngagharị iwe ha chọburu ime n'ụbọchi iri na otu nke ọnwa a gbasara oke ogbugbu na Naịjirịa. Ha sị na ọ ga-adịba ruo mgbe a mara ọkwa ọzọ. Onyeisi ha bụ Samson Olasupo Ayokunle, kwuputere nke a ụnyaahụ n'akwụkwọ ndepụta, ebe o kwukwara na ha ga-eme ekpere na ibuọnụ ụbọchị atọ n'ụlọụka niile dị na Naịjirịa nakwa ngalaba CAN niile dị na steeti niile, nke ga-ebido n'ụbọchị Julaị 9 ruo Julaị 11. Ngalaba na-elebanye anya na kemịkal e ji eme ngwaagha a kpọrọ ""Organization for the Prohibition of Chemical Weapons"" na Bekee, e kwuola na ọ bụ klorine ka ndị omekome jiri wakpoo ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ n'obodo Douma dị na Syria n'ọnwa Epreelụ. Ịji cheta ka ihe a si mee n'ọnwa Epreelụ, gụọ ya ebe a Ọgụ Sirịa: Ngwaagha kemịkal egbuola ọtụtụ ndị mmadụ N'egwuregwu, ka a gbapụrụ Brazil n'asọmpi Iko Mbaụwa ụnyaahụ, onye nchịkọta ha bụ Tite, ekwuola na ha pụrụ maka na Belgium bụ ndị ha zutere, gbakarịrị ha. N'otu aka ahụ, cheta na Ingland na Swiden ga-ezute ibe, ebe Rọshịa na Kroeshia ga-asọ mpi ịmata ndị ga-agafe agba ọkara Ikpeazụ. Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a Ihe nkiri nke taa" https://www.bbc.com/igbo/afirika-44749734 +health Ebola in DR Congo: Ebola arịpụtala isi ọzọ ebe ahụ abalị abụọ WHO chọrọ ịnye ha nturu ugo maka imeri ya bụ ọrịa "N'Afrịka, ụbọchị abụo ka ọ fọrọ ka World Health Organisation (WHO) welie mba DR Congo aka elu dịka mba nwegooro onwe ha n'aka ọrịa Ebola, ya bụ ọrịa esepụtala isi ọzọ na mba ahụ. Echi bụ Sụnde ka WHO na-akwado inye ha ntụrụ ugo dịka mba chụrụla ọrịa Ebola ọsọ ụkị̀ụ eruala. Mmadụ puku atọ, na narị anọ bu ya bụ ọrịa ebe mmadụ puku abụọ na narị abụọ nwugoro na ya kemgbe ọ pụtara afọ abụọ gara aga na mba ahụ. "" Pierre-Emerick Aubameyang kwesiri ịba n'otu bọọlụ ga-ebuli ya elu"" Onye kwuru nke a bụ onyeisi egwuregwu futboolụ nke mba Gabon na-agwa ndị ntakụko were sị na kamgbe Aubameyang gara arsenal na onwetabeghị ihe nturu ụgo obụla n'ihi na dịka arsenal na-agba ọnyụpa, Aubameyang so kwa ha agba ọnyụpa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52257906 +business School closures: Coronavirus emeela m ihe ọkụ ji nti oke eme - Onye nkuzi ụlọakwụkwọ nọrọ onwe ya Otu onye nkuzi n'ụlọakwụkwọ bụ Amarachi Madumere akọwala etu mmechi ụlọakwụkwọ n'ihi coronavirus si metuta ya na ezinaụlọ ya. Ọ sị na ọ dịzi ka onye na-enweghi ọrụ kamgbe e mechiri ụlọakwụkwụ n'ọnwa Maachị n'ihi coronavirus. Madumere sị na kemgbe Maachị ahụ na o ribeghi ụgwọọnwa ya. Kama nọ bụ obere azụmaahịa ka o ji na-enyere onwe ya na ezinaụlọ ya aka. Kirie ihe o kwuru n'uju; Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-53325945 +business Ovaioza news: Ọ bụ eziokwu na Ovaioza egwuola ndị mmadụ chandum? "Ọtụtụ ndị mmadụ tinyere ego ha n'ụlọọrụ a kpọrọ 'Ovaioza Farm Produce Storage Business' nọzị ugbua na-eche ihe ha na ụbọchị ga-aga. Nke a na-abịa dịka ngalaba 'Securities and Exchange Commission' (SEC) jichiri akara ọbaego niile nke ụlọọrụ ahụ, n'ihi na ha sị na ọ bụ ụlọọrụ adịgboroja. Ọ bụ eziokwu na onye nwe ụlọọrụ a bụ nwa ada Imu Ovaioza Yunusa na-ekwu na ego ndị mmadụ efughị efu, mana ụfọdụ ndị tinyere ego ha na ya bụ ụlọọrụ na-ebe na ha ahụbeghị isi ego ha ma ya fọkwa ọmụrụnwa e kwere ha na nkwa kwa ọnwa. Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii anwụchiela Ovaioza n'Abuja dịka nnyocha ha ka na-aga n'ihu gbasara ebubo na o riri ego ndị mmadụ. Ụfọdụ ndị tinyere ego n'ahịa ahụ kọọrọ BBC Igbo etu eke si anya anwụ banyere ahịa ha tụrụ n'aka Ovaioza. Nde naịra asatọ na ụma alaala - Nelisa Otu onye n'ime ndị sị na ha tinyere ego ha n'ụlọọrụ Ovaioza bụ nwaada aha ya bụ Nelisa Okonkwo Juliet. Nelisa gwara BBC Igbo na ihe ya tinyere n'ụlọọrụ Ovaioza nde naịra asatọ na ụma. ""Ihe m ji bido bụ N500,000, mechaa tinye nde abụọ, mechaa tinye nde atọ, mechaa tinye otu nde, mechaa tinye N600,000."" ""Ọ bụ otu a ka ego m dị Ovaioza n'aka si ruo nde asatọ na ụma otu narị puku naịra (N8.1 million)."" Nelisa kwukwara na kamgbe ya malitere itinye ego n'ahịa Ovaioza, o ritela ọmụrụnwa karịrị nde naịra abụọ. ""Mana ugbua, achọghịzi m ime. Achọrọ m ka o nyeghachi m isi ego m,"" ka o kwuru. BBC Igbo akpọtụrụla Ovaioza n'ekwe ntị, n'ozi SMS, n'ozi whatsapp, nakwa ozi facebook, mana zabeghị anyị. Nwa ada ọzọkwa aha ya bụ Chukwudi Somack Mmesoma gwakwara BBC Igbo na o tinyere nde naịra atọ n'aka Ovaioza. ""Etinyere m nde naịra abụọ n'aka otu enyi m sokwa n'azụmahịa Ovaioza, mana n'aka nke onwe m, etinyere m otu nde naịra."" ""Otu enyim ọzọ chọrọ igbu onwe ya oge ọ chọpụtara na ego ya efuola."" Ọ bụ n'ụbọchị 24 nke ọnwa Maachị ka Ovaioza wepụtara ozi n'akara Facebook ya wee kwuo na ndị SEC kpọchie ọbaego ya niile. O kwuru na enwere ndị kpesara ụlọọrụ ya n'aka ndị SEC nke mere ha ji kpọchie ya. ""Akpọchiela ọbaego niile nwere akara BVN mụ na ha, ma ọbaego ndị na-enweghị ihe ọbụla gbasara ha na ụlọọrụ m,"" Ovaioza dere. ""Mana nkea emetụtaghị ndị tinyere ego n'ụlọọrụ m, n'ihi na ego ha niile dị na ngwaahịa; ego ha adịghị n'ụlọakụ ọbụla."" ""Ọ bụrụ na m na-ere ahịa m, aga m na-akwụghachi ndị niile tinyere ego ha n'ụlọọrụ m."" ""Ọ bụrụkwa na ha chọọ ka m bunye ha ngwaahịa, aga m emekwa nke a na-egbughị oge ọbụla."" Akụkọ pụtakwara na ụlọọrụ SEC kpọchikwara ụlọ Ovaiosa n'Abuja, dịka ha mechiri ọbaego ya niile. Ọ bụ otu ọkaiwu aha ya bụ Azubuike Ihemeje wegara mkpesa n'aka ndị SEC gbasara azụmahịa Ovaioza, nakwa etu o si anakọ ndị mmadụ ego na soshal midia. Ihemeje bụ onyeisi ụlọọrụ ndị ọkaiwu a na-akpọ 'Relief Law Chambers'. Dịka o si depụta n'akara 'Facebook' ya, Ihemeje kwuru na ọ na-ewute ya oge ọbụla ndị mmadụ tufuru ego ha n'ụlọorụ adigboroja jupụtara ebe niile na Naịjirịa. O kwukwara na ya bụ ụzọ mee nnyocha ya nke ọma wee chọpụta na azụmahịa Ovaioza akwụghị ọtọ. Mana oge ọ jụrụ ajụjụ gbasara ya na 'Facebook', Ovaioza na ọtụtụ ndị otu ya malitere ịkparị ya ma na-akpọ ya aha ọjọọ dị icheiche. Ka oge na-aga o kpebiri na ya ga-emerịrị ihe gbasara ụlọọrụ adigboro a Ovaioza mepere, ọ bụ ya mere o ji degara SEC akwụkwọ ka ha nyochaa ya. BBC Igbo na-agba mbọ ịnụ n'ọnụ ọkaiwu Azubuike Ihemeje gbasara nke a. Onye bụ Ovaioza Ezigbo aha nwaada a bụ Imu Ovaioza Yunusa, ọ bụ onye Okene dị na Kogi steeti. Ọ nwetara ọzụzụ dịka nọọsụ mana ọ bụ ịzụ ahịa nri ka ọtụtụ mmadụ ji mara ya. Site n'akara Facebook ya, Ovaioza na-akpọ ndị mmadụ nwere mmasị ka ha nya ya ego iji zụta ngwanri ma ree ya, ha na ya ekezie ọmụrụnwa si na ya. Ihe ọ na-ere gụnyere osikapa, ọka, unere, garị, unyi, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Dịka o si kọwaa, ọ na-ego nri ebe o buru ibu oge nri ahụ na-amịpụta nke ukwuu, ma chekwaa ya. O ruzie oge nri ahụ na-akọ ụkọ n'ahịa, o buputa ya ree n'ọnụahịa buru ibu, ya na ndị nyere ya ego ekee ọmụrụnwa ya ụzọ iri, ndị wetara ego were ụzọ asaa, ya bụ Ovaioza ewere ụzọ atọ. Mana ọtụtụ ndị tinyere ego ha n'aka nwa ada a ekwuola na ụlọahịa ya bụ nke adigboroja. Ovaioza nwekwara ụlọọrụ ọzọ ebe ọ na-akụziri ụmụnwaanyị aka ọrụ dị icheiche; ọ kpọrọ ụlọọrụ a 'Ovaioza Skills Acquisition Centre'. Akụkọ na-abịa..." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60965236 +politics Igbo Presidency 2023: ‘Joe Biden ọ dị afọ ole, onye sị na Tinubu akaala nka ịbụ onyeisiala?' – Joe Igbokwe "Joe Igbokwe bụ ọn�� na-ekwuru pati All Progressive Congress (APC) na Legọs Steetị tinyere ọnụ n'okwu banyere ndị Igbo ịzọta ọkwa Onyeisial Naịjirịa n’afọ 2023. Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Igbo tara ụkwa ma jaa eze banyere etụ ndị si eme ndọrọndọrọ ọchịchị nke ha. Mgbe a jụrụ banyere etu ndị Igbo ga-esi nwete ọchịchị Onyeisiala Naịjirịa ọkachasị na ntuliaka afọ 2023 na-abịa abịa. Igbokwe sị ""ndị Igbo adịbeghi njikere ịzọta ọkwa onyeisiala Naịjirịa, mana ha ka nwere ohere ma ọ bụrụ ha zọpụ njem dị n'ime ya"". O kwuru hoo haa na otu agbụrụ enweghị ike ịzọta ọkwa onyeisiala Naịjirịa. Ọ sị na ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ala Igbo gụnyere ndị Eze obodo, ndịisi ụka, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kwesiri ịmapụ njem ịga ka ha na ndị agbụrụ ọzọ nwee nkwekọrịta maka ebu n’obi ha. Ọ sị na ọ bụru na ndị isi a gakwuru Bola Tinubu kọwaara ya mkpa ọdị maka onye Igbo ịchị Naịjirịa na ọ ga-aghọta. BBC Juru ya ajụjụ ndị mmadụ kpụ n’ọnụ gbasara ahụike onye ndu APC bụ Bola Ahmed Tinubu bụ nke ha na-ekwu na ahụ esichaghị ya ike. Joe is na “ Tinubu bụ agụ abụọ dị n'ime n’otu. O siriike ka anụ gbara abụbụ”. Ọ sị na ndị na-ekwu otu ahụ amaghị ihe ha na-ekwu. O kwuru ọtụtụ ihe dị n’ime ihe onyonyo a ị ga-ekiri. Ọnụ na-ekwuchitere otu Ohaneze bụ Alex Ogbonnaya gwara BBC Igbo na ha ga-aga hụ Bola Tinubu na ndị ọzọ maka ịhụ na onye Igbo ga-abụ onyeisiala Naijirịa. Ọ bụ dịka Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuchitere otu patị All Progressive Congress (APC) na Legọs Steeti kwuru sị, "" Ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ala Igbo gụnyere ndị Eze obodo, ndịisi ụka, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kwesiri ịmapụ njem ịga ka ha na ndị agbụrụ ọzọ nwee nkwekọrịta maka ebu n’obi ha"". Ogbonnaya kwuru sị, "" Eee, ihe Igbokwe kwuru mara mma. Anyị na-akwado ịme njem ịhụ ndị ọchịchị agbụrụ ọzọ maka ọchuchọ ọchịchị ndị Igbo"". O kwuru sị na ọ bụrụ na enyeghị ndị Igbo ọchịchị afọ 2023na ọ ga-esiri ndị Ighbo ike, Ọ kọwara sị, ""Ọ bụrụ na ihe siere ndị Igbo ike, ọ ga-emetụta ebe ndị ọzọ na Naijirịa""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60990129 +health Coronavirus outbreak: 'Obodo Wuhan dị ka ịkpa a na-eli mmadụ' - Nwata akwụkwọ Naịjirịa "Chukwuma Nzube bụ onye na-agụ akwụkwọ na Wuhan, na mba China akọwala etu ndụ siri dịrị ha na obodo Wuhan bụ ebe ịba Corona sị bido na Disemba 2019. Nzube kwuru na ndị Naijirịa bi Wuhan ruru iri asaa na otu ma ọtụtụ n'ime ha bụ ndị na-agụ akwụkwọ n'obodo a. O kwukwara na obodo Wuhan nwere ihe dịka mmadụ nde iri na otu bị na ya mana ị pụta n'ezi, ị gaghị ahụ otu onye. Ọ sịkwa na ọ bụ naanị ndị nwere akwụkwọ ikikere ọkachasị ndị ọrụ gọọmentị nwereike ịgagharị. Onye ntaakụkọ BBC Igbo jụrụ ya sị, 'kedụ etu ụnụ si ebi kamgbe mmachịrị ngagharị?' Nzube sị na o bi n'ụlọ ụmụakwụkwọ ma sịkwa na kamgbe izuụka atọ, ọ pụbeghị ezi. Ọ sị na dịka ọ dị ugbua, ha ayọgidela ndị gọmenti Naịjirịa maka enyemaka na obi ha adaala mba n'ihi na o nweghị ihe ha nwereike imezi ọzọ. O kwukwara na ọtụtụ mmadụ apụọla n'ebe obibi ha ma sịkwa na mmadụ ole na ole fọrọ na atụ ụjọ izute onwe ha maka ibute ọrịa Corona. Ụjọ na-atụkwa ha nke mere na ụkwara kwaa ha ma ọ bụ ahụ ọkụ mee ha obi amapụ ha ma ha ebutela ya bụ ọrịa. Ụnụ a na-eri kwa nrị? O kwuru sị ""ndị gọomentị Chaịna na-enye anyị nri ugboro atọ n'ụbọchị na ihe ndị ọzo anyị na-eji ebi ndụ"" Nzubechukwu kwuru sị ""Ana m arịdata ogogo iri na abụọ ma rigoo kwa tupu m rie nri n'ihi na achọghị m iji igwe nritu gbada ala maka ụjọ ibute ọrịa"". O kwuru na onye chọro ịzụ ihe ga-azụta ya n'intanetị mana ọ na-adazị oke ọnụ. Kedụ ihe gọọmentị ndị Naijirịa merela unu? Nzubechukwu kwuru sị ""mgbe m nọ Naijirịa, ana m anụ na gọọmentị anaghị elekọta ndị Naijirịa nọ na mba ofesi mana ejirila m anya m hụ na ọ bụ eziokwu"". O kwukwara ""Ọ bụ naani na Naijirịa ka ndị ọmeiwu ga-eji ihe dịka corona ama njakịrị, na ndị sị obodo ọzọ dịka Ghana, ndị gọmenti ha na-akpọ ha ma na-ezitere ha ihe"". Ọ mere ka BBC Igbo ghọta na kamgbe a machiri ha ịgagharị, gọọmentị Naijirịa ezitebeghị ndị Naijirịa nọ na Wuhan ozi ọbụla. O kwukwara na ọ bụ nani onye nnọchite anya naijirịa bụ Baba Ahmad Jidda sitere n'akpa nke ya nye ha otu nde naira. Ma ọ sị kwa na kamgbe ọ nyechara ha ya bụ ego, na ha anụbeghi umere ya ọzọ. O kwuru sị ""Minista na-ahụ maka ahuike siri ezigbote asị mgbe ọ sị na e nweghị onye Naijirịa nọ Chaịna chọrọ ịlọta"". Kedụkwanụ etu ịsị echekwa uche maka isi mgbaka? Nzube sị kwa na ọ na-emegharị ahụ nke ndị Bekee na-akpọ 'Exercise'. Ọ sị kwa na o bidoro ịgụ akwụkwọ asambodo ọzọ n'intanetị iji chekwa onwe ya maka isi nkoropu. Ihe nlekọta Naijirịa nọ n'ofesi kwuru Onye na-ekwuchitere Odoziakụ Dabiri-Erewa nke bụ onyeisi ndị na-elekọta nhazi ndị Naijịrịa bi n'ofesi bụ Abdurahman Balogun sị na ha enyela ndị otu ụmụ ụlọakwụkwọ bi na Chaina ekwenti ha ga-akpọ n'inwete ozi aka ndị gọọmenti. Mana Abike Dabiri bụ onye na-elekọta ndị Naịjrịa nọ n'ofesi dere n'akara Twitter ya sị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51564856 +religion Fr. Mbaka atụgharịala duru ndị nsonso ya na ngagharịudo ikwado Bishop Onaga "Na-erughi otu izu o kwuru na ọ maghị ihe ọbụla banyere ngagharịiwe ndị nsonso ya mere n'ụlọọụka ya, Fada Ejike Mbaka atụgharịala duru ha na ngagharịudo. Fada Mbaka na ndị nsonso ya mere ngagharịudo a iji gosi nkwado ha n'ebe bịshọpụ Enugwu Dayọsis bụ Bishọp Callistus Onaga, nọ. Ntụgharị a na-abịa dịka ndị nsonso Adoration Ministry Enugwu, bụ ụlọụka Fada Mbaka, mechara ngagharịiwe n'ụbọchị ụka, ebe ụfọdụ n'ime ha nọ na-ekwu sị ""Onaga ga-apụrịrị"". Fada Mbaka n'ụbọchị Wenezde, 22 nke ọnwa Juun afọ 2022, duuru ndị nsonso ya bịara n'ụlọụka Adoration, na-agwa ha ka ha laghachị n'ụlọ ha n'ihi na ha ekwesịghị ịka ụka ụbọchị ahụ. Ọ gwara ha sị na ọ chọghị ka onye ọbụla kparịa Bishọp Onaga ọzo, na ọ chọrọ ka onye obula na-ekwu naanị ihe ọma gbasara Bishọp. O kwuru sị na ọ ka bụkwa ụkọchukwu ụka Katọlik, nke bụ na ọ gaghị nupuru bishọpụ ya isi. O kwuru sị ""Ịkparị Bishọpụ m bụ ịkparị m...na-ekpere anyị ekpere, kpeere m ekpere, kpeere Bịshọpụ ekpere. ""Kpeere Peter Obi ekpere. Ọ bụ nwanne anyị. Ọ bụ nwa anyị. ""Ka anyị chebiri ihe ụka ga-agwa anyị mee. Anyị agaghị agbakọzị ebe a (Adoration ground) ruo mgbe e kpebiri. ""Unu akparịzịla Bishọpụ na soshal midia. Anyị na Bishọpụ anyị enweghi nsogbu."" Ọ malitere ịgụpụta ihe ndị mmadụ dere n'akwụkwọ ha ji eme ngagharịudo, nke gosiri ihe ọma dị iche iche ha dere maka Bishọp. Cheta na e dechara okwu ọjọọ na ndị nke ha ji mee ngagharịiwe mbụ. Ndị Adoration ji ohere ahụ na-arịọ Bishọp Onaga arịrịọ mghaghara maka ngagharịiwe ha mere, ma rịọ ya ka ọ hapụkwa ka ụka Adoration malitekwa ọzọ." https://www.bbc.com/igbo/articles/c03p6nz3l03o +entertainment 'Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia egosighị ebe mu na Uche Maduagwu kpere udo' - Jim Iyke "Na mkparịtaụka BBC Igbo na onye ejije ""Nollywood"" a ma ama bụ Jim Iyke mere ọ kọwara na ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia egosighị ebe ya na Uche Mmaduagwu kpere udo. Jim Iyke kwuru na ya gara zute Maazị Maduagwu maka ihe o mere kpasuru ya ịwe n'ihe ọ bụ ihe nwere ikike imetọ aha ọma ya ma meetọ ihe ejije ọhụrụ ya. O kwuru na n'ezia njem nleta ọ gara ileta Maazị Mmaduagwu bụ maka udo na ọ bụghị maka ọgụ mana ka ihe si mee na mbido ezigbo ịwe ebubo o boro ya nakwa etu o si zaa ya ajụjụ mere o ji chọọ iti ya ihe. Ọ gara n'ihu kwu na ya na Uche Mmaduagwu kpere udo n'okwu ahụ. O kwukwara na Maazi Maduagwu sị na ọ bụghi olileanya ya ebute ọgụ mana, ọ bụ ihe egwuregwu na ihe ọchị ọ na-eme na soshal midia kpara ya ji kwuo ihe o kwuru. Dịka Uche Maduagwu boro Jim Iyke ebubo na o si n'ụzọ aghọghọ na nke na-ezighi ezi kpata ego, BBC Igbo jụrụ ya nke bụ eziokwu n'okwu a. Jim Iyke kwuru na okwu a bụ ezigbo ugha, ọ gara n'ihu kwuo ọrụ aka ole m ole o ji ugbua nke gụnyere: Ụlọọrụ na-ahazi njem, Ụlọọrụ Teknzụ, Ụlọ ọrụ na-ebugharị ngwo ngwo ndị mmadụ, Ụlọ ezimike 'Airbnb' kariri anọ, Ụlọọrụ na-ere akwa na ihe ejiji. N'okwu ya o si ""Ebidoghi m taa kpatawa ego, ọ bụghị ihe niile ka mmadụ na-etinye na soshal midia. Mgbe m dị afọ iri abụọ na otu ka m bidoro mewa ihe onyonye na ihe ejije Nollywood"" O kwukwara na o tinyela ụchụ na ihe ejije ọ na-eme nke gụnyere i ga njem n'ofesi gaa guo akwụwkọ banyere ikata ego na ihe ndị ọzọ nyiri ya. Jim Iyke duru ndị ntọrọbịa chọrọ ịrụ ọrụ ihe ejiji ndụmọdụ ka mara na ọ bụghị sọ ihe egwuregwu ma ọ bụ ezigbo ihe ahịa a na-etinyere ụchụ eme. Jim Iyke gwara BBC Igbo na ihe a mere abụghị ihe nkwado ejije ọhụrụ ya nke aha ya bụ 'Bad Comment', ma ka ihe si mee, ọ mere na ndabanye na ihe mere metụtara isi okwu ejije ya. Ọ kọwara anyị na ihe kpatara o ji mee ejije a bụ agwa ọjọọ ole m ole ndị mmadụ kpasara ya na soshal midia nakwa ndị ọzọ ọ ma. Ọ tụpenyere BBC Igbo azụ ndị a ma ama nọ n'ime ihe ejije a, ��fọdụ n'ime ha bụ: Chewetalụ Agu, Young Jon (the Wicked Producer), Timaya , Desmond Ellitot, Rugged man, Francias Duru , Ay The Comedian, Warri Pikin, dgz. Ọ Kọwara BBC Igbo na ejije a pụtara n'ụlọ ihe onyonyo bekee na-akpọ 'cinemas' ugbua, o kwukwara na ọ ga a pụta n'ihe teknzu 'Netflix' ne-ebe ọnwa Dịsemba. Na nchikọta, ọ rịorịọ ndị ntorobia arịriọ ka ha na-akwado ihe ejije 'Nollywood' etu ha si akwado nke ndị bekee na ndị Ịndịa. O kwukwara na ime ihe ejiji na Naijịrịa adịghị mfe dịka gọọmentị anaghị etinye aka na-ikwado ihe ejijie etu ndị bekee na ndị mba ọzọ si eme." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58339108 +entertainment Igbo culture: Ụzọ ise esi amara nwada Igbo zuru ka e mee A na-asị na nwaanyị bụ ihe maọbụrụ nke na-ewebata akụ. Agbala nwaanyị na-aka ibe ya. Lee ihe ise mere ndị gboo ji ekwu na nwaanyị na-aka ibe ya. Nke bu ụzọ bụ ọlaedo ya Nwaanyi ọbụla tozuru etozu n'ala Igbo anaghị eji ọla aka ya maọbụ ọlaedo ya egwuegwu egwu. Ọ ga-awa emume ọha, ọ nyakọsia ya na-azọnye ije. O nwereike ire ọlaedo ahụ were ego ya goro agbaagba ihe bara nnukwu uru dịka ala, ụlọ maọbụ ụgbọala.Ite ọna Ọ na-abụ emewe mmemme n'ala Igbo ma ite ọna apụtabeghị, ịmara na mmemme ahụ ezubeghị oke. Ite a kacha galaa ọnụ n'ime ite niile ụmụwaanyị ji esi nri n'ala Igbo. Agadaga nwaanyị Igbo ji eme ọnụ mewe mmemme ite ọna ya niile apụta ama iji gosi na ọ dị nkwadobe maka ya bụ emume.Efere puruiche eji eri nri O nwere efere ga-abu ewere nye gi nri, ọ dị gị ka nri ahụ agwuchala agwụchala. Nke a bụ ụdiri nwaanyị na-eme ọfụma n'ala Igbo nwere o ji enye di ya maọbụ ndị ọbia nri. A na-eji ọlaedo, ọla nchara maọbụ igwe nkụwa (ọkụ) eme ụfodụ efere a bụ eriwe na ya echezọ mkpa.Ubi na ọbaji na ọbaede ya Ị chọrọ ima nwaanyi na-emesi ike n'ala Igbo mgbe gboo, jụọ ese ọbaji na ọbaede ya. Ọ gaghị agbajo ikọ ma hazie ji na ede ndị ọ ga-ere ere na nke ya na ezinulọ ya ga-eri. Otu ụmụnwaanyị Nwaanyị Igbo ọbụla ma uru ị nọ n'otu ụmụnwaanyị obodo ya maọbụ obodo ebe a na-alụ bara. A na-akwanyere nwaanyị ọbụla so n'otu umụnwaanyị nnukwu ugwu. Agba na-aka ha n'okwu gbasara ndozi obodo. A na-ekwu na oke nwaanyi so n'otu ụmụnwaanyị anaghị efu efu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52397562 +business Nnyocha NDDC, NNPC, ụlọakụ na nrụrụaka ise kpọtụru akpọtu na Naijiria "Kemgbe izu ole na ole, ụmụ Naijiria na-ele ihe nkiri na-eme ka ihe onyonyo Nollywood dịka ụlọmeiwu na-eme nnyocha ihe mere ego dị ijeri iri anọ nagala a kpọrọ ""Niger Delta Development Commission"" (NDDC) kwesiri iji rụọ ọrụ mmepe obodo. Bido n'ebubo nke onye bụbu onyeisi NDDC bụ Joy Nunieh boro Godwill Akpabio bụ Mịnịsta na-ahụ maka Niger-Delta, onye ụlọọrụ NDDC dị n'okpuru ya were rue nke Akpabio boro ndị omeiwu ruo etu ndị Uweojii si wakpoo ụlọ Nunieh n'ụzọ ụtụtụ, ihe nkiri na-eme na-etipụta ụfọdụ ụmụ Naijiria akwa, ebe ọ na-atọkwa imirikiti ọchị. Mana ọ bụghị taa ka ukwu jiri dị n'azụ, nnyocha NDDC abụghị mbụ e merela nnyocha kpụ ọkụ n'ọnụ na Naijiria dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-ewe ha dịka bụ ""ụja nkịta na-agbọ onye nwe ya"". Lee ụfọdụ nnyocha e mere metụtara mmefu ego, i chere na chi ga-eji ehihie jie na Naijiria mana o jighị: 1. Nnyocha ijeri dọla 16 ($16Bn)ego ọkụ latrik nke afọ 2009 Nke a bụ nnyocha ihe mere ijeri dọla iri na isii ego e tinyere na ịhazigharị oku latrik na Naijria bido n'afọ 1999 rue afọ 2007 nke Ụlọomeiwu Nta site na kọmiti ha na-ahụ maka ọkụ latrik. Tupu nnyocha ahụ abịa na njedebe, egwu dagharịrị dịka a malitere tụwa onye ndu kọmịti ahụ lebara ya anya bụ Ndudị Elumelu aka iri ngarị. Ihe e jiri nchọpụta ahụ mee: Ka nnyocha ahụ bịara na njedebe, naanị anọ n'ime ihe iri asatọ na asatọ kọmiti Elumelu tụnyere alo ka e mee bụ ihe e mere. 2. Nnyocha ebubo mmefu ego dị N628 eboro Patricia Olubunmi Etteh oge ọ bụ onyeisi ụlọomeiwu nta E nyochara Patricia Etteh, onye bụbu onyeisi Ụlọomeiwu Nta n'afọ 1999 maka imefu N628m na ịrụzi ụlọ obibi onyeisi Ụlọomeiwu nta n'Abuja. Ihe e jiri nchọpụta ahụ mee:E mechara jiri maka nnyoha ahụ chutuo Etteh n'ọkwa onyeisi ụlọomeiwu Nta n'afọ 2009. Mana Lawan, onye bu nnyocha ahụ n'isi ma bụrụkwa onye ọtụtụ na-ahụta dịka onye na-akwụba aka ya ọtọ mechara maa na ọnya nrụrụaka dịka a chọpụtara na o riri ngarị. 3. Nnyocha ihe mere ego ụlọakụ Ụlọakụ etiti bụ CBN n'aha ịchafụ mere nnyocha ụlọakụ dịga na Naijiria ma rụọ ụfọdụ ndị isi ụlọakụ gụnyere Erastus Akingbola, nke Intercontinental Bank, Cecilia Ibru nke Oceanic Bank na Bartholomew Ebong nke First Bank aka maka ebubo nrụrụaka n'ime ndị isi ụlọakụ. Ndị ọzọ bụ Francis Atuche nke Bank PHB,Sebastian Adigwe nke Afribank na Okey Nwosu. Nnyocha ijeri Naira 555( N555billion) ego batara n'akpa Nigeria National Petroleum Corporation (NNPC) bido na Decemba 2004 na Eprelu 2007 n'oge ọchịchị Umaru Musa Yar'Adua. Ihe e jiri nchọpụta ahụ mee: A chụrụ ndị isi ụlọakụ iri abụọ n'ọrụ, kpụpụ ọtụtụ ha ụlọikpe. E mechara tụọ Cecilia Ibru mkpọrọ ọnwa iri na asatọ ma nye ya iwu ka ọ kwụchigha ebe Erastus Akingbola onye ejichiburu na mkpọrọ gbatara isi onwe ya n'ụlọikpe kachasị. 4. Nnyocha Dasuki, Olisa Metu maka mmefu ego nchekwa Nke a mere ngwangwa Onyeisiala Muhammadu Buhari batara n'ọkwa ya n'afọ 2015. E boioro Sambo Dansuki ebubo imefu ijeri dola abụọ($2bn) bụ ego e kwesịrị iji zụọ ngwa agha maka ọgụ Boko Haram. Ndị ọzọ a rụụ aka n'ebubo ahụ gụnyere Chief Raymond Dopesi, nwee DAAR Communications PLC, aka chịburu Sokoto steeti bụ Attahiru Bafarawa, onye bụbu Mịnịsta nta na-ahụ maka eg Bashir Yuguda. A rụkwa nwa afọ Igbo bụ Olisa Metuh aka n'ebubo ahụ si na o mefuru ego dị nde naira 400 . Ihe e jiri nchọpụta ahụ mee:A kpụpụrụ ndị a ụlọikpe maka ị zara ọnụ ha. E mechara tụrụ olisa Metu mkpọrọ afọ asaa maka ya. Nnyocha NNPC E nyochara ụlọọrụ na-ahụ maka mmefu ego dị tari atọ (3trillion naira) nke mere n'afọ 2016. Ọ bụ Ụlọomeiwu Ukwu n'oge Bukola Saraki bụ onyeisi ya hibere kọmiti lebara anya na nrụrụaka na-aga n'ụlọ mmanụ agbịdị na Naijiria ma mee Senetọ Jibrin Barau, onyeisioche kọmiti ahụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53514026 +politics Naanị otu nwaanyị so azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa 2023 Princess Ojei Chichi bụ naanị nwaanyị Independent National Electoral Commission (Inec) depụtara aha ya dịka onye so azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023. Princess Chichi na azọchitere pati Allied Peoples Movement (APM) ọkwa a. O si n'akụkụ ndịda Naịjriịa nke Delta steeti. Osote ya bụ Ibrahim Mohammed dịka Inec siri depụta. Ngalaba nhazi ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission ewpụtela aha ndị ga-eso zọọ ọkwa ọchịchị dị icheiche na gọọmentị etiti na ntuliaka 2023. Inec bipụtara aha ndị a taa bụ Tuzde 20 Septemba 2022 dịka ha si kwubuo, ebe achụmnta vootu ga-amalite n'uju n'ụbọchị 28 nke ọnwa Sepụtemba 2022. Gọvanọ David Umahi ga-eso zọọ ọkwa Sineti Dika ọ chịtaghị aja na ndọrọndọrọ imeụlọ ndị APC maka ọkwa onyeisiala, Gọvanọ Umahi ga-azọzi ọkwa Sineti nke Ebonyi South. Aha ya dị n'akwụkwọ nke Inec, mana ha dere na ọ bụ mkpebi ụlọikpe kpatara nke a. Cheta na ọ bụ nwanne David Umahi bụ Augustine meriri ntuliaka imeụlọ ndị APC maka ọkwa a, mana ọ rituuru Gọvanọ Umahi dịka ọ dachara na ntuliaka imeụlọ nke onyeisiala. Onyeisi Sineti bụ Ahmad Lawan amabeghị ọnọdụ ya Ka ọ dị ugbua, onyeisi ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa bụ Ahmed Lawan agaghị eso zọọ ọkwa Sineti na 2023. Lawan so na ndị zọrọ ntuliaka imeụlọ APC maka ọkwa onyeisiala, mana ọ nwetara naanị vootu 152. Akụkọ kwuru na oge Lawan chọrọ ịlaghachi azụ ga zọọ ọkwa Sineti nke Yobe North, onye meriri ntuliaka imeụlọ APC maka ọkwa ahụ bụ Bashir Machina jụrụ ajụ irituru ya. Ka ọ dị ugbua, Inec etinyeghị ma aha Ahmed Lawan ma nke Bashir Machina n'akwụkwọ a ha bipụtara. Rochas Okorocha agaghị eso zọọ ọkwa ọbụla na 2023 Rochas Okorocha bụ aka chịburu Imo steeti ma bụrụkwa onye na-anọchite anya Imo West n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa, mana aha ya agaghị adị na ndị ga-eso zọọ ọkwa ọbụla na 2023. Okorocha zọrọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka imeụlọ nke ndị APC mana o nwetaghị ọbụladị otu vootu. N'oge ahụ, kepukepu pụtakwara na ọ si azụ ụlọ gbata akwụkwọ pati PDP maka ọkwa Sineti, mana odoghị anya ma akụkọ ahụ ọ bụ eziokwu. Ka ọ dị ugbua, aha Okorocha adịghị n'akwụkwọ ndị Inec, ma na APC, ma na PDP. Na APC, ọ bụ Osita Izunaso ka Inec wepụtara aha ya maka ọkwa Sineti nke mpaghara Imo West; na PDP ọ bụ Onyeriri Jones ka aha ya dị na ya. https://www.bbc.com/igbo/articles/cxreldg0wq9o +politics Ihe mere m ji gbaa arụkwaghịm dịka mịnịsta Ọkụ n’oge Jonathan - Barth Nnaji "Ọkammụta Barth Nnaji bụbụ Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ latrik na Naijiria n’oge ọchịchị aka chịbụrụ Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan akọwaala na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị enyi ha achọghị ka ya gbasoo ụsoro ziri ezi na nhọrọ ndị ga-azụ ụlọọrụ latrik ndị gọọmentị resịrị ndị nkịtị mere ya ji tinye akwụkwọ arụkwaghịm. Nnaji bụ onye hazirị atụmatụ ire akụkụ dị iche iche metụtara ọkụ latrik na Naijiria tupu ọ gbaa arụkwaghịm n’ike n’afọ 2012 nke tụụrụ ọtụtụ ụmụ Naijirịa. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso a, Barth Nnaji, onye rụbụrụla ọrụ inginia ọkaibe na mba Amerịka tupu ọ lọta rụwa ọrụ mịnịsta na Naịjirịa kwuru  na ya na-azọ isi onwe ya oge ahụ nke mere ka o tinye akwụkwọ arụkwaghịm ahụ n’ihi na ya achọghị imetọ aha ya. Nwa afọ a bụbụkwa Minista na-ahụ maka Sayensị na Naịjirịa kwukwara na ihe abụọ mịnịstri ya mapụtara maka itozu ịzụ ụlọọrụ na-ekesa ọkụ latrik a kpọrọ ‘discos’ na Bekee bụ na ụlọọrụ ọbụla ga-azụta ya ga-enwe akatamkpo ego n’akpa iji tinye n’ịrụzi ihe ndị dị mkpa. Nke a abụọ bụ na ụlọọrụ ahụ ga-abụ nke ihe gbasara ọkụ latrik doro anya nke ukwu . O kwuru na ọ bụ n’ihi na ya kwechiri n’ịhụ na ọ bụ naanị ụlọọrụ ndị nwere ihe abụọ a bụ ndị ga-azụtali ụlọọrụ latrik nke Gọọmentị Naijiria chọrọ ire oge ahụ mere ka ndị anya ha dị n’izụ ụlọọrụ ndị a mana ha enweghị ihe a chọrọ jiri kpawara ya nkata ọjọọ. O sịri na ọ bụrụ na ya gbara isi akwara ghara itinye akwụkwọ arụkwaghịm, a kara igbu ya. ""Ọ bụrụ na nọrọ dịka Mịnịsta , ọ ga-abụ na ha ka egburu m maọbụ na m kwetara soro ha na-emetọ aka etu ha chọrọ."" Nnaji kwuru na ọ bụ n’ihi  na emeghị atụmatụ ahụ a kpọrọ ‘Privatatsation’ etu o kwesịrị mere na Naijiria ka na-enwe nsogbu inwe ọkụ latrịk rue ugbua. O meela ihe karịrị afọ 10 e resịrị ndị nkiti akụkụ ụlọrụ latrik dị iche iche na Naịjirịa. N’okwu ụlọọrụ Aba Geometric power plant, o kwupụtara ọnọdụ ọkụ dị na mpaghara Aba oge ha zere ya ma kọwa nsogbu ha nwere na ime ka atụmatụ ahụ nke o kwuru ruola pasent 97 ịbịa na mmezu. Na nchịkọta Nnaji kwupụtara ihe mmepe ụlọọrụ ghara emere ndị bi na mpaghara ahụ ma ọ bụrụ na obido ọrụ n’ọnwa ole na ole na-abịa. Gee ihe ndị o kwuru n'uju n’ihe onyonyo dị n'elu akụkọ a." https://www.bbc.com/igbo/articles/c9epzrl91j0o +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Moses apụọla n'otu ga-aga Russia Akụkọ kachasị mkpa: Ndị IPOB na ndị uweoji na-ama aka n'Anambra steeti. Nke abụ maka iwu ndị IPOB nyere sị ndị mmadụ ha nọrọ n'ụlọ n'ụbọchị 30 nke ọnwa mee. Ndị uweojii jisike na-ekwu na ha enweghi ịke ị nye ụdị iwu ahụ. Ebe ọzọ na Naịjirịa Minister na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed ekwuola na Buhari mezuru nkwa niile o kwere ndị Naịijirịa. Ọ sị na Buhari doziri ihe ndị gbasara nchekwa, akụ na ụba obodo na npụ karịcha. Na mba Ofesi Onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị kachasị na Italy akpọla oku ka achụtuo onyeisiala ha bụ Sergio Mattarella n'ọkwa ọchịchị Luigi Di Maio kwuru nke a mgbe onyeisiala ha jụrụ ị nabata aha Guiseppe Conte dịka minista ga-eso n'ọchịchị ya Cheta na amabeghị onye meriri ntuliaka Italy mere kemgbe ọnwa Maachị. N'egwuregwu Moses apụọla na otu 'Super Eagles' ga-aga asọmpị iko mba ụwa. Moses Simon bụ onye egwu boolu 'Super eagles' agaghị aga Russia n'ihi na ọ merụrụ ahụ na akpata ụkwụ. Nke a pụtara na ọ fọrọ mmadu iri abụọ na itoolu ga-agazi asọmpịi ahụ. Gee akụkọ ndị mere taa n'ime otu nkeji https://www.bbc.com/igbo/afirika-44277377 +sports Arsenal vs Newcastle: Arsenal ewerela 'chizoba' zaa aha nna ha Ndị otu egwuregwu bọọlụ Arsenal, esorola ndị Manchester City, Liverpool nakwa Tottenham were gbaa aka ahịa na afọ EPL ọhụrụ. Arsenal gbalịrị zaa aha nna ha site n'iji otu ọkpụ goolu merie Newcastle taa. Mana mmeri ahụ akpụghị ọkụ n'ọnụ n'ihi na ha achakeghi ka ọnwa ma ncha. Aubamenyang bụ onye nyere otu goolu ahụ ha ji gbaa aka ahịa na nkeji iri ise na asatọ. Lịka lịka niile ndị Newcastlke gbara iji saa otu goolu ahụ amịtaghị mkpụrụ. Mmeri a ga-atọ Unai Emery, onye nkụzi ndị Arsenal ụtọ maka na ọtụtụ n'ime ndị Arsenal jiri biri esoghi sọọ mpi nke taa. Mmadụ dị ka Alexandre Lacasete nakwa David Luis bu onye e si Chelsea zụta abalị ole na ole gara aga anọghị n'egwu taa. Ọzọkwa, Pepe, bụ onye Arsenal si Lille na France zụta, esoghi bido bọọlụ taa, kama e tinyere ya etinye na nkeji iri asaa na otu. N'aka nke ọzọ, onweghi onye meriri na asọmpi nke dị n'etiti Leicester na Wolves. Ha abụọ gbara onwe ha onye lawa onye lawa. Anya niile nọzị na ama egwuregwu 'Old Trafford' ebe ndị Manchester United ga-ezute ndị Chelsea. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-49313396 +health Coronavirus lockdown: Etu e si achụghachị ọtụtụ ndị na-achọ ịbata n'Abia na Enugwu Steeti Kamgbe ọnwa abụọ gara ka ọtụtụ steeti na Naịjirịa bidoro mmachi i si na steeti bata na steeti n'ihi coronavirus. N'otu aka ahụ Onyeisiala Buhari nyekwara iwu ka agbachie okeala jikọtara steeti niile, mana na ọtụtụ mmadụ ka na-esi n'otu steeti baa n'ọzọ. Ọtụtụ mgbe ka a nụ akụkọ na ndị nchekwa nwuchiri ndị si mpaghara ugwu na-chọ ịbata na steeti dị n'ọwụwanyanwụ. Mana i ji chọpụta nke bụ eziokwu, anyị kpọtụrụ ndị gọọmentị ụfọdụ steeti dị n'ọwụwanyanwụ. N'Abia Steeti odeakwụkwọ mgbasaozi gọvanọ Okezie Ikpeazu bụ Onyebuchi Ememanka, ọ sị na nke a bụ eziokwu. O kwuru na ọtụtụ mgbe ka ndị ọrụ nchekwa nwuchiri ụgbọala bu ndị mmadụ na-achọ ịbata Abia Steeti. N'ịmaatụ, ọ sị na e jidere ụmụnwaanyị si Akwa Ibom nabata Aba, jidekwa ndị awụsa si ụzọ Enugwu nabata Aba na nso nso. Ọ sị na nso nso na e jidekwara ụgbọala ukwu bu ndị ugwu si Akwa Ibom nabata Umuahia mana a chụghachịrị ndị niile ahụ azụ ebe ha si. N'otu aka ahụ, kọmishịọna mgbasaozi n'Enugwu bụ Chidi Aroh sị na ọtụtụ mgbe ka ndị ọrụ nchekwa na-anwụchi ndị na-abata na steeti ha. Ọ sị na na-esi na steeti dị iche iche gụnyere Legọs, Abuja, nakwa mpaghara ugwu ndị ọzọ. Mana ọ sị na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa ka ọ dị n'aka ịma kpọmkwem ebe ndị a si na-achọ ịbata Enugwu. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe gwara BBC Igbo na ha na-achụghachị ndị ekwesịghị ịbata n'obodo ruru okeala nso. Na kọmshịona uweojii bụ Ahmed Abdulrahman na-agarukwa ebe ahụ ịhụ etu ndị otu ya si echekwa okeala ndị ahụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52659255 +politics Ọ fọrọ obere ihe ka m si ndị DSS kpọrọ gakwuru Nnamdi Kanu – Chiwetalu Agu Dịka ndị ọrụ nchekwa tọhapụrụ Chiwetalu Agu bụ onye ejije Nollywood a ma ama, ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche taa bụ 15 Ọktoba ebe ọ kụwaara anyị akị oyibo Nsugbe gbasara ihe ọ gabigara na aka ndị ọrụ nchekwa n’izu gara aga. O kwuru na bido mgbe ọ dị na nwata, na ọ bụ onye onyinye ya mere na mgbe o si njem site na Asaba na-aga Onitsha, ndị mmadụ gbakọrọ bịa izute ya dịka ọ bụ onye ama ama. Chiwetalu kwuru na ọ nwere obi ọmịkọ nye ndị ogbenye nọ n’etiti ndị gbakọtara izute ya, nke mere o ji bido kwewe achicha (bread) n’etiti okporo ụzọ Upper Iweaka nọ n’Onitsha. Maazị Chiwetalu kwuru na achicha ọ zụtara ma kee ụbọchị ahụ ruru ọnụ ego puku iri. N’okwu ya, o si na ya bụ mgbakọta mere ndị agha jiri bịa nwuchịe ya, o kwuru na mgbe ha bịara ịnwụchị ya, ọ jụrụ ha ihe ọ mere ma ha asagha ya. Ha gara n’ịhụ dọrọ ya ma kpọbaa ya n’ime ụgbọala ha. O kwuru na ha dọkaturu akwa ya nke e sere ọwụwa anyanwụ. Mgbe BBC Igbo jụrụ ya maka kepu kepu kwuru na ndị agha tiri ya ihe ma merụọ ya ahụ mgbe ha bịara ịnwụchị ya, o kwuru na ya bụ akụkọ bụ akụkọ ugha mana na ihe mere bụ ha dọrọ ya na aka kpụba ya n’ime ụgbọala ha. Maazị Chiwetalu gara n’ihu kwuo na ndị agha si n’Onitsha buru ya gaa ọdọ ndị agha nọ na Enugu Steeti bụ “82 Division” ma malite gbawa ya ajụjụ ọnụ nke gụnyere ihe mere o jiri nyiri akwa e sere ọwụwa anyanwụ na-ekesa achicha n’okporo ụzọ Onitsha. O kwuru na ọ kọwara ndị agha atụmatụ ya nke bụ atụmatụ udo. Oge ha ahụghị ntụpọ ọ bụla n’aka ya, ha nyefere ya n’aka ngalaba ndị agha pụrụiche n’eme nnyocha bụ “Special Intelligence officers” na bekee. O kwukwara na ndị ngalaba a gara n’ihu gbaa ya ajụjụ ọnụ ruo ihe kariri elekere itolu. O kwukwara na ha nyochara ime ekwe nti ya, ma jụọ ya ajụjụ banyere ihe niile ha hụrụ n’ime ya bụ ekwe nti. Dịka ha mere nnyocha nke ha ma hapụ ịhụ ntụpọ ọbụla n’aka ya ha nyefere ya n’aka ngalaba ndị uweojii pụrụiche bụ ndị DSS n’aha ịchafụ. Chiwetalu kwuru na ndị DSS buru ya n’ụgbọala ha n’isi ụtụtụ ụbọchị ahụ gawa isi ụlọọrụ ha nọ n‘Abuja. Ọ kọwara BBC Igbo ihe ọ gabigara n’aka ndị DSS mgbe ha tinyere ya na nga pụrụiche, nke gụnyere na ha gbara ya ajụjụ ọnụ ma nyochakwa ekwe nti ya. O kwukwara na ọ gwara ha maka ọrịa shuga ji ya nakwa maka ọya afọ ji ya nke mere na nri o na-eri jiri bụ nri pụrụiche. Maazị Chiwetalu kwukwara na ndị ọrụ DSS gwara ya na ebe edobere ya bụ n’okpuru ụlọ ebe edobere Maazị Nnamdi Kanu. O kwuru na olileanya ya bụ ka ọ hụtụ Nnamdi Kanu ma nke a emeghi dịka enyeghi ya ohere ịhụ ya. Ọ kọwakwaara BBC Igbo na ndị ọgbọ ya n’eme ejije gbakọtara maka igbapụta ya nke gụnyere ọgbakọ ndị ejije a na-akpọ “Actors Guild of Nigeria”. O kwuru na onyeisi ọgbakọ a bụ Emeka Rollas ziteere ya ndị enyemeka ndị gụnyere Maazị Steve Egbu, Mike Ozekhome, nakwa Monalisa Chinda. O kwuru na dịka ndị ọrụ nchekwa hụrụ na aka ya dị ọcha nakwa ọ nweghi ihe ọjọọ ọ bụla ọ mere, ha gwara ya etu akparamagwa ọ kpara dịka onye a ma ama nwere ikike ikpalite ọgbaghara ma kwasa udo nọ ebe ahụ. Na nchịkọta okwu ya, o kwuru na ọ bụ naanị udo ka o chọrọ nke bụ ndị mmadụ na arịọ ya ka ọ zọọ ọkwa gọvanọ Enugu Steetị, o kwuru na atụmatụ a dị mma mana ọ gaghị azọ ya bụ ọkwa dịka ụzọ ndị ndọrọndọrọ adighi mfe. O kwukwara na dịka ọ bụ onye eziokwu, ọ banye ime ọrụ ndọrọndọrọ, ọ ga ekwu ka ndị ndọrọndọrọ kwụsị nrụrụaka, mpụ na aghụghọ, nke nwere ike ikpalite iwe ha ma mee ka ha chụpụ ya. Ọ gara n’ihu kwuo na ọ ga edobe ya bụ akwa kpalitere ọgbaghara n’ime ụlọ pụrụiche nke bụ “National Archive” maọbụ na akụkụ pụrụiche n’ụlọ ya bụ “Personal Archive” ka ọ bụrụ ihe nkiri i ji cheta ihe ọ gabigara. O kwukwara na ọ ga-akwa akwa ọcha ọzọ nke a ga ese ọnwuwa anyawụ i jị gọsi na obi ya dị ọcha. Maazị Chiwetalụ ji ndụmọdụ chịkọta okwu ya gwa ndị ọchịchị nke gụnyere onyeisiala Buhari ka ha soro ụzọ udo na nke mkparịtaụka n’ọchịchị ọha ma hapụ oke aka ike. O kwukwara ka e hiwe ọgbakọ ndị okenye ga-anọchite anya akụkụ Naịjirịa niile ime ya bụ mkparịtaụka. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58926022 +politics Nigeria political party primaries: Kedụ etu m ga-esi bụrụ ‘delegate’? Kamgbe e mechara ntuliaka ime ụlọ nke otu ndọrọ ọchịchị na Naịjirịa, ọtụtụ mmadụ na-aju ese etu ha nwereike iji bụrụ 'delegate'. Mana tupu ị na-eche echiche ịbụ otu n'ime ha, ọ dị mkpa ka ị bu ụzọ mata ndị bụ 'delegate'. Ndị delegates bụ ndị so n’ime otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị a họpụtara n’ụzọ pụrụiche ka ha nwee ike ibinye aka n’oge ntuliaka ime ụlọ ma họpụta ndị ga-eji ọkọlọtọ otu ahụ azọ ọkwa dị iche iche. Ndị delegates na apụta ihe ma ọ bụrụ na otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị agbaso ntuliaka ime ụlọ a kpọrọ ‘indirect primaries’. E nwere ndị delegates ụzọ abụọ, nke mbụ bụ ‘adhoc delegates’ bụ ndị a họpụtara nwa obere oge iji họpụta ndị ga-azọ ọkwa. Ọzọ bụ ‘statutory delegates’ bụ ndu ndu maọbụ ndi ji ọkwa n’otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma adhoc ma statutory delegates, na-arụcha otu ọrụ Iwu ntuliaka afọ 2022 (electoral act 2022) sị na pati ọbụla ga-agbasọ ntuliaka ime ụlọ a kpọrọ 'direct primaries maọbụ i'ndirect primaries'. Onye jiri indirect primaries, mee ntuliaka na ọ bụ na a ga-ahọpụta delegates pụrụiche nke bụ na ndị ‘statutory delegates’ agaghị esonye. Ndị ụlọomeiwu mere iwu ọhụrụ nke sị ka ‘statutory delegate’ soro họpụta onye ga-azọ ọkwa mana Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyebeghi aka na ya. https://www.bbc.com/igbo/articles/cxeng784lzlo +entertainment Chika Ike: O nweghị sakramenti jikọọ mụ na Ned Nwoko, di Regina Daniels "Chika Ike bụ ome ejije Nollywood ekwuola na o nweghị eiokwu dị na-akụkọ na-efegharị nke kwuru na ya na di Regina Daniel bụ Ned Nwoko na-eme enyi. Kepukepu na-efegharị na soshal midia na-arụbu ya aka dịka ihe onyonyo fegharịrị na-egosi ebe onye yiri Nne regiina Daniel bụ Rita Daniels na-eti mkpu sị Chika ike hapụrụ nwa ya di ya. Mana dịka otu onye ihe ya na-amasị jụrụ ya ma ọ na-ayị Ned Nwoko, Chika Ike zara n'aka Instagram si na o nweghị sakramentị jịkọrọ ya na nwoke ahụ nke ọlụlụ ọ lụrụ Regina Daniel n'afọ gara aga wuru ewu na soshal midia. Cheta na abalị ole na ole gara aga na n ne Regina Daniel pụtara gọọ na ọ bụghị eziokwu ihe e kwuru na ya bụ ihe onyonyo ahụ fegharịrị ebe o kwuru nna ọ bụụ na Chika ahapụghị nwa ya na ya ga-agara ya ije na mụọ sị na ihe onyonyo ahụ bụ ""a rụrụ arụ."" Regina Daniels atụnyere ndị ntị na-akọ ọkọ banyere ihe mere na ndụ ya nso nso azụ. Cheta na Regina onye na-ewu na soshal midia kemgbe ọnwa atọ kwere nkwa ịkụwa akịoyibo Nsugbe. N'ozi mgbaama dị n'ihe onyonyo o wepụtata na nsonso, ọ kpọrọ okwu aha kpomkwem sị n'ezie na kepukepu ahụ na-ewu banyere alụmdi ya bụ eziokwu. Regina, onye aha Igbo ya bụ, Nneamaka, kwuru sị ""Alụọla m di"" dịka o wepụtara ọla aka dị ya n'aka tinye na mkpịsịaka nke so ọdụdụaka. Ọ gara n'ihu zaa ndị na-ekwu na ọ bụ maka ego mere o jiri lụọ onye tọrọ ya mgba n'elu, mgba n'ala sị, ""Obi na atọ m ka nnu ugbua n'ihi na ịhụnanay na-egbu m ka mmanya."" Ọ tụpụkwara egbe ntụnala dịka o kwuru na onye ikpeazụ o degara ozi n'ekwe ntị bụ Somadina. Cheta na dịka akụkọ na ọ lụụ onye ndọrọrọndọọ ọchịchị ama ama bụ Ned Nwoko na-ewu, akụkọ na ọ gbahapụrụ Somadina bụ onye ọtụtụ na-arụ aka na ọ bụ enyi ya nwoke wukwara." https://www.bbc.com/igbo/afirika-48637928 +politics Nigeria presidential election 2023: ‘Kpọpụta mmadụ niile chọrọ ịzọ ọkwa ka anyị mara onye ruru m’ – Peter Obi Akachibụrụ Anambra steeti na otu onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2023 bụ Peter Obi gwara BBC Igbo obi maka atụmatụ n’ịzọ ọkwa. Obi kwuru na nsogbu ya abụghị nke okwu ‘zoning’ nke bụ inye mpaghara ọbụla ohere ịzọ kama ihe ka mkpa bụ ịkpọpụta mmadụ niile nwere mmasị ịzọ ọkwa, nyochaa ntozuoke ha ma họpụta onye kacha mma nakwa onye kacha tuzuo oke site n’ogogo agụmakwụkwọ, ihe onye ahụ rụrụla n’oge gara aga, agwa ya nakwa ihe ịgba ama ndị ọzọ ga-atuziri ọha aka ma ya bụ onye abụ onye kwesịrị ịchị Naịjirịa ugbua. Obi onye kwupụtara mmasị ya n'ọkwa a n'okpuru pati People's Democratic Party (PDP), tinyere ọnụ n’okwu ndị na-ekwu na ha na-achọ nnwereonwe n’aka Naịjirịa kwuo “Ihe ndị mmadụ ji ekwu na ha achọghịzị ịnọ n’otu (na Naịjirịa) maka a na-eme ha mmegbu” “Di na nwunye mee mgbasa bụ maka na enwere nsogbu” Ọ kọwara na atụmatụ ya n’ịzọ ọkwa a bụ ịkpọ Naịjịrịa ọnụ nke ọma ka enwee udo na ịhụnanya. Nke a na-abịa dịka n’afọ ole m ole garala aga, ọtụtụ ndị n’akụkụ dị ịcheịche na Naịjịrịa malitere eti mkpu nnwereonwe nakwa nkewapụ nke gụnyere otu Yoruba Nation na Indigenous People of Biafra (Ipob), bụ ndị bu okwu a n’isi na nso nso a. Maka okwu ego gọọmentị Obi kọwara etu o siri mee ihe dị iche n’Anambra nke mere gọọmentị ya jiri hapụ idaba n’ọnọdụ ịbị ego nakwa iji ụgwọ. “Anyị kwụsịrị nkwarị na nkwasa ego gọọmentị” Maka abụbọ ọrụ ndị nkuzi na Naịjirịa, Obi kwuru na ọ ghọtara iwe ha ma rutuaka na ihe ha na-eme bụ ihe dịrị ha dịka gọọmentị emezughị nkwekọrịta ha na ndị nkuzi na Naịjirịa. Obi kọwara na ihe ga-eme ka Naịjịrịa gaa n’ihu ma meepee bụ ma ọ bụrụ na akwalite agụmakwụkwọ nke ọma. Ọ kwukwara ihe ọ ga-eme ma ọ bụrụ na otu Pati People's Democratic Party (PDP) ghara ịhọpụta ya dịka onye ga-azọchịtere ha ọkwa onyeisiala maa gaa n’ihu kagbuo okwu ndị na-ekwu na ọ na-azọ ọkwa ibu osote onyeisiala ma Atiku Abubakar nweta mmeri. Obi kọwara na ọ ga-agba mbọ gbapụta ọtụtụ ndị mmadụ n’ụbịam site n’ikwado ọrụ aka ndị mmadụ. O tinyekwara ọnụ na nsogbu enweghị nchekwa na Naịjrịa ma kọwaa na a gbapụta ndị mmadụ n’aka ụbịam, tigbuo zọgbuo nakwa ọgbaghara jupụtara na Naịjịrịa ga-adaju. Obi kwuru na ikwado ndị agha ga-enyereaka na atụmatụ inweta nchekwa ọzọ na Naịjirịa. O kwuru na ewezuga nchekwa na “ebe ihe nrite Naịjịrịa kacha nọrọ bụ na mpaghara ugwu ”. Ọ kọwara na mpaghara ugwu kacha nwee ala sara mbara nke mere ọzụzụ ụmụanụmanụ nakwa ọkụkụ ugbo jiri amụbawanye nke ukwuu ebe ahụ. O kwuru na mmanụ agbidi ekwesịghị ịbụ ebe akụnaụba Naịjirịa kwesịrị ịgbado okwu kama ọ kwesịrị ịbụ n’ọrụ ugbo. Ọ gara n’ihu kọwaa na mpaghara ugwu karịrị ọtụtụ mba dị nọ n’ụwa n’isaa mbara. Kirie ihe onyonyo a n’uju ka ị nụrụ ihe Peter Obi kwuru. https://www.bbc.com/igbo/61501549 +business Nigerian Customs sị na onye otu ha bịara ụlọọrụ ha n'Abuja ejichaghi uche aka "Joseph Attah bụ ọnụ na-ekwuru ngalaba na-ahụ maka ibubata ngwaahịa na Naịjirịa bụ Customs ekwuola uche ya na onye otu ha bịara njem n'ụlọọrụ ha taa ejighi uche ha. Ọ sị na ọ bụ ezioukwu na onye ọrụ ahụ ndị mmadụ tinyere foto ya na soshal midia yi ọkwa akpọrọ ""Deputy Comptroller General"" na Bekee wee bata n'ụlụọrụ Customs n'Abuja. ""Ọ bụ eziokwu na ọ bịara, mana ọ bụghị eziokwu na ọ bịara n'ụlọọrụ onyeisi anyị. ""Ka ndị mmadụ hụrụ ya, hụrụ ọkwa o yi n'uwe ya, a gbara ya ajụjụ ọnụ, ma chọpụta, site n'etu o si asa na o jighi onwe ya aka."" Attah sị na ha kpọrọ dọkịnta mgbe a hụrụ n'ihe a abụghị nke ha e meeli. Ọ sị na onye a nwere ọkwa ""Assitant Superintendant"" aha ya bụ Dahiru nọ n'ụlọọgwu ugbua."" Ọtụtụ okwu a na-ekwu maka nwa amadị a abụghị eziokwu. ""Ndị mmadụ na soshal midia amachaghi ihe mere. Ha na-ekwu ihe ọbụla ha chọrọ. Onye nke a kwuo nke ya, onye ọzọ e kwuo nke ya.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48916058 +health Coronavirus awareness: Etu ndị Enugwu si echekwa onwe ha maka nje a "Ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ nke Bekee kpọrọ ""World Health Organisation"" ka na-etikwa mkpu sị na ọ bụ ịkwụ na nchụkwa bụ out ụzọ dị mkpa n'ọnọdụ igbuso nje coronavirus agha ma gbochie ya ifesa mmadụ. Ihe anyị mere n'akụkọ a bụ ịga Enugwu, bụ isi obodo Enugwu steeti, ga chọpụta ma ndị mmadụ amaka nke ekwe na-akụ. Kirie ya n'elu." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52378351 +entertainment In pictures: Egwuregwu ndị a ga-eji echeta Ezenwaanyị Elizabeth II BBC Sport lebara anya na ndụ Ezenwaanyị biri n'ihe gbasara egwuregwu. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-62845838 +entertainment Igbo Tradition: Otanjele, uri na ihe ntecha ndị ọzọ ụmụagbọghọ Igbo ji achọ mma mgbe gboo Nwaagbọghọ Igbo ọbụla na-amaghị ka e si etecha onwe ya dị ka nkịkara akwa n'anya ụmụagbọghọ ibe ya. Ị chọrọ ịma agbọghọ chapụrụ achapụ, ị lee ya anya ị ga-ahụrịrị ka ahụ ya si akwọ mụrụ mụrụ maka ihe ntecha dị iche iche o jiri chọọ onwe ya mma. Akụkọ a ga-egosi anyị ihe ntecha ole na ole ụmụagbọghọ Igbo ji achọ mma mgbe elu ka bụ ala ọsa. 1.Ka anyị malite n'ọtangele: Ọtangele bụ pawụda ojii. Ọ dị ka ihe eji unyi akwọrọ akwọ wee mee. Nke a bụ nke a na-akpanye n'anya. Ụfọdụ na-akpọ ya tiro. Ụmụagbọghọ techaa ọtangele, anya ha a na-egbuke ka ọnwa. 2.Uri Ihe ntecha a esi na mgbọrọgwụ enweta bara ezigbo uru n'ala Igbo makana eji ya ese eserese n'ọnụ maọbụ ụkwụ nwaanyị Igbo ọbụla ọ na-amasi. O nwereike ite ya n'ahụ ma ọ na-eme emume alụmdi na nwunye maọbụ ọ gawa mmemme ndị ọzọ a na-eme n'ala Igbo. E nwekwara ike iji uri dozie ụlọ maọbụ ahụ aja ụlọ mmadụ. Mbata ozioma nke Jesu Kristi metụtara etu esi akwanyere uri ugwu maka na ndị ụka na-eche na ọ bụ ihe ndị ọgọ mmụọ. 3.Uhie Uhie bụ pawụda na-acha uhie uhie. A na-eji ya akwado ụfọdụ ụmụagbọghọ maka alụmdi na nwunye n'oge gboo. E techaa nwaagbọghọ uhie a, ahụ ya a na-akwọ mụrụ mụrụ. 4. Ayọrọ Mgbaji Nke a bụ nke ụmụagbọghọ na-anya n'ukwu ma n'olu. Ọ na-abụ nwaagbọghọ chọọ ịlụ di, a nyanye ya n'ukwu, olu ma ụkwụ ka ndị mmadụ kiriwe mma ya. Ọ na-achakarị uhie uhie maọbụ ọcha. Gịnị na-emezi ugbua? Ihe ejirila ike gbanwe ugbua dịka ihe ndị a gbara kasa. Ọtangele, Uhie ọnụ ma ayọrọ mgbaji eyirila uwe ọhụrụ nke buzi na onye ukwu ma onye nta jizi ha eme ngala ma na-enweta ezigbo ego site n'ire ha. Ndị ntecha mere aka ọrụ na-ekwusi ike na ọ na-agara ha ezigbo ahịa makana nnunu ichọ mma ahụ na-ebe mgbe ahụ n'etiti ụmụnwaanyị ka na-ebe ugbua. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52553379 +sports Champions League: Usoro eji ga-agba asọmpi Usoro a ga-esi agba okara-ịkpeazụ asọmpị Champions League apụtaala. Liverpool na Roma ga-asọ mpị n'ụbọchị 24 n'ime ọnwa Epureeli, ha ga-agba ụkwụ nke abụọ n'ụbọchị abụọ n'ime ọnwa Mee. Bayern Munich na Real Madrid ga-atụ aka n'ụbọchị 24 n'ime onwa Epureeli na ụbọchị otu n'ime onwe Mee. Ha ga-agba ngwụcha asọmpị a n'obodo Kiev n'ala Ukraine n'ụbọchị 26 n'ime ọnwa Mee. Liverpool bụ ndị mmeri Champions League n'afọ 2005. Ha na ndị Roma agbabeela bọọlụ ọbụla kamgbe ọnwa Maachị afọ 2002. Bayern Munich ekwuola na Niko Kovac ga-abụ onye ga-anọchị Jupp Heynckes dịka onye nkuzi ha n'asọmpị a. Nke a ga-abụ ugboro abụọ Heynckes kuziri Bayern ka mgbe mmeri ha n'afọ 2013. Mana asọmpị ha na ndị Real Madrid ga-ekpo ọkụ makana Real bu ndị buru iko a n'afo garaaga. Real Madrid emeriela iko a ugboro atọ n'ime afọ anọ garaaga. https://www.bbc.com/igbo/afirika-43750158 +health Gingivitis, periodontitis na ọrịa ndị ọzọ ga-etinyenwu ọnụ gị na nsogbu "E nwere ike a jụọ gị ọrịa ndị ị ma na-enye nsogbu n'ọnụ mmadụ i kwuo; ọnụ isi, eze ure nakwa eze mgbu, mana ị ma na ọrịa eze nwere ike igbu gị? Ndị ọkachamara n'ihe gbasara eze, ọrịa na-eso eze na nlekọta ya, na-akọwa na ọ bụghị naanị ihicha eze gị n'ụtụtụ ga-egbochi ụfọdụ ọrịa na-eme n'eze mmadụ. Dọkịta na-ahụ maka eze gwara BBC Igbo na ụfọdụ mmadụ esila n'ọrịa eze laa mmụọ, mana anyị ga-akọwara gị etu nke a si eme. Ị na-ata atụ n'ụtụtụ mana ọ bụ naanị ebe ahụ ka ihe gbasara idebe ọnụ gị ọcha biri? Dkt Olakunle Ogunbayo bụ dọkịta eze kwuru sị na o bighi naanị n'ịta atụ n'ụtụtụ; ihe ndị ị na-etinye n'ọnụ gị na-eso eme ka ị mara ma eze ọ ga-ere gị maọbụ ọ gaghị ere gị. Ọ gara n'ihu kpọpụta ọrịa ndị nwereike imekpa eze gị ahụ nakwa etu ị ga-ezi echekwa eze gị. Lee ọrịa ndị ahụ nwereike ịkpa mkpamkpa n'ime ọnụ gị, ọkachasị n'eze gị: 1) Eze kpọpuru akpọpu/eze ure (Cavities/dental caries): Ị ma ihe ahụ na-acha ọcha na-adị n'eze gị tupu ị saa ọnụ n'ụtụtụ? Ọ bụkwa ya bụ ""plaque"" a na-ekwu okwu ya. Mana mgbe ọ na-abụ nsogbu bụ mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-anaghị asa eze ha hapụrụ ya ka ọ tọkịrị n'eze ha, kpọọ nkụ ebe ahụ dịka foto a na-egosi n'ala. Eze mkpọpu na-esikarị n'ebe nke a kpọrọ ""plaque"" bụ ihe ahụ na-acha ọcha na-anyado n'eze na-amụkọ n'eze onye anaghị ata atụ ọfụma, nri fanyere n'eze, asọmmiri nakwa nje bakteria. Bakteria a na-amụpụta asidi dịka ọ na-erikwa nri ị na-etinye n'ọnụ. Nke a na-eme ka eze gharazie isi ike etu o kwesịrị. Nke a na-emekwa ka ya bụ bakteria na-abanye n'ime ime eze, mee ka okpuru eze ebe a na-akpọ ""pulp"" na Bekee ghere oghe. Eze ghere oghe butezie ọrịa, eze ahụ anwụọ. Ihe ọzọ na-ebute mkpọpu eze a nke na-ebutekwa eze mgbu bụ ịṅụfe mmanya maọbụ nri ndị nwere shuga oke. Mana ị ga-egbochinwu eze gị inwe mkpọpu ma ọ bụrụ na ị na-asa eze gị kwa mgbe kwa mgbe n'ihi na ọ ga-ewepụ ""plaque"" a na-amụkọ n'eze, nakwa site n'igakwuru ndị dọkịta eze bụ ndị ga-ewepụnwu plaque ahụ. ""Ludwig's Angina"" bụ ọrịa eze nwereike ibute ọnwụ gị ma ị na-akpachaghị anya. Ọrịa a bụ ọrịa na-eme n'ala ọnụ mmadụ, n'okpuru ire nke nwereike ibute ihe a kpọrọ ""tooth abscess"" bụ mgbe abụ banyere n'ime eze mmadụ. O nwekwara ike ịbanye n'ime akụkụ ọnụ ndị ọzọ ọkachasị ma mmadụ nwee ọnya n'ọnụ. Ihe ndị ọzọ na-egosi na mmadụ nwere nsogbu a gụnyere ọzịza ire, olu mgbu na ntị mgbu, ilo ihe nakwa ikwu okwu nwereike ịra ahụ, nakwa mgbe iku ume rawara ahụ ụfọdụ oge. Ọzọ bụkwa na ọ na-ebute ahụ ọkụ, mgbagwoju anya nakwa ike ọgwụgwụ. Gịnị na-ebute ọrịa a? Elekọtaghị eze gị ọfụma, ọnya n'ime ọnụ nakwa ụfọdụ oge ọ bụrụ na efopughi gị eze ọfụma. Gbara gakwuru dọkịta eze ma dịrị ihe a mewe gị, makana o nwereike ibute ọnwụ. 3) Ọzịza ukwu eze (Gingivitis): Ọrịa a na-emekarị ndị okenye karịa ụmụaka. Ọ na-abịa mgbe bakteria na-eri n'ọnụ mmadụ mụkọrọ n'ukwu eze mmadụ, nke na-eme ka plaque (nke a na-akpọkwa ""tartar"" maọbụ ""calculus"") ahụ na-amụkọ n'eze mmadụ sie ike. Nke a na-amụkọ ma na-agbasa oghere dị n'etiti eze, ma bute ọzịza ukwu eze. Ụfọdụ ọgwụ mmadụ na-aṅụ nwekwara ike ibute ọrịa eze a. Ihe ndị na-egosikarị na mmadụ nwere nsogbu a karịa na ukwu eze onye ahụ zara aza gụnyere na ukwu eze ahụ ga na-agba ọbara ma ọ na-echi eze ya, o nwereike inwe eze mgbu, ọnụ ya ga na-esikwa isi. Ọ bụkwa ọzịza ukwu eze a na-agwọghị agwọ na-ebu ụzọ egosi na mmadụ enweela nsogbu a kpọrọ ""periodontitis"", nke nwereike ibute mmebisi ihe ndị na-ejide eze mmadụ nakwa mee ka eze na-adapụsị. Ukwu eze gị na-aza aza gbaa mbọ gakwuru ndị dọkịta eze ka ha lee ya anya. Dkt Ogunbayo kwuru na e nwereike isi n'eze mmadụ mara ma o nwere ụfọdụ ọrịa gụnyere ọrịa shuga (diabetes) nakwa nkwụsị ịhụ nsọ na nwaanyị (menopause). 4) Periodontitis: Ọrịa a na-esi na ọzịza ukwu eze a na-agwọghị agwọ malite, nke bụ na elekọtaghị eze ọfụma na-ebute ọrịa a. Bakteria na-ebute ozịza ukwu eze, na-ebute periodontitis a bụ mgbe uru anụ na ọkpụkpụ na-ejide eze malitere iri mperi. Periodontitis na-akpa mkpamkpa, ọ na-eme ka oghere dịchaa n'etiti eze nakwa n'ukwu eze dịka foto a dị n'elu. N'afọ 2019 ka ndị ọkammụta sayensị chọpụtakwara na ọrịa a nwereike ibute ọrịa nchefu ihe a na-akpọ ""Alzheimer's"" na Bekee. A na-eche na ọ na-egosikwa na mmadụ nwere ọrịa ogbu na nkwonkwo a na-akpọ ""Arthritis"" na Bekee. 5) Ọnụ isi (halitosis): A ka kwesịrị ịkọwara gị nke a? Ọnụ isi bụ mgbe ajọ isi si mmadụ n'ọnụ na-ekuputa ma o meghee ọnụ. Ụfọdụ oge ọ na-abụ n'ihi elekọtaghị eze nakwa ọnụ ọfụma na-ebute ya, mana ọnọdụ ahụike mmadụ na-ebutekwa ya. Elekọtaghị eze dịka mgbe mmadụ akpachapụghị ihe kpafanyere ya n'eze, bakteria bịazie tinye aka gbarichaa ya, onye ahụ abanye na nsogbu a. Ihe ndị ọzọ na-ebute ya bụ ise anwụrụ, ọnụ asọmmiri kọrọ (dịka mgbe mmadụ anaghị emepụta asọmmiri etu o kwesịrị nakwa ụfọdụ ndị na-eghewe ọnụ oghe arahụ ụra) nakwa ụfọdụ ọgwụ mmadụ na-aṅụ maka ọrịa ndị gụnyere ọbara mgbalieleu nakwa ọrịa mammịrị. Igbochi ya, ị ga na-asacha nakwa na-aghụchasị eze gị ma ị gụrụ gụrụ. Ị ga-agakwurukwa dọkịta eze. 6) Eze iju mmadu n'ọnụ (hyperdontia): Nke a bụ mgbe eze juru mmadụ n'ọnụ, ụfọdụ na-eto ma n'ukwu eze ebe eze ekwesịghị ito. A na-ejikarị ihe nnyocha X-ray achọta ya. Ụfọdụ na-eto n'azụ eze 32 ahụ na-adị onye toro eto n'ọnụ, bụrụzịa ihe a na-akpọ 'eze ịyaramịya'. Ọnọdụ a anaghị afụkarị ụfụ, mana ụfọdụ oge ọ na-eme ka ukwu eze gị zaa aza, nakwa mee ka eze gị ndị nke nọ ọfụma gbagọo agbagọ. Amachaghị ihe na-ebute ya, mana a na-eche na ụfọdụ ọrịa na-esi n'agbụrụ efe mmadụ gụnyere ""Gardner's syndrome"", ""Ehlers-Danlos syndrome"" na ndị ọzọ. Anaghị agwọkarị ya, mana ọ bụrụ na ọ na-enye onye nwe ya nsogbu dịka ma ọ na-ata ihe maọbụ n'ịta atụ, ndị dọkịta na-ewepụ ya. 7) Eze ịkọ mmadụ n'ọnụ (Hypodontia) bụ ndịiche ""hyperdontia"": ""Hypodontia"" bụ mgbeeze karịrị isii bụ nke na-ekwesịghị ịdapụ adịghị n'ọnụ mmadụ. Nke a dịkwa iche na mgbe eze mmadụ ezughi ezu n'ihi na ọ merụrụ ahụ maọbụ na o nwere nsogbu eze. Gịnị na-ebute ya? Ọ na-esikarị n'agbụrụ. Etu e si agwọ ya? Ndị dọkịta eze na-ejikarị ihe ha na-akpọ akwa (dental bridge) ejide eze arụrụ arụ ka ọ ghara ịmịchapụta. Ha na-ejikwa nke a kpọrọ ""dentures"" bụ eze arụrụ arụ, etichi eze ndị ahụ nakwa ""dental implants"" bụ nke yiri ezigbo eze mmadụ a na-esi n'ukwu eze etinye. Ọrịa ndị ọzọ na-enye nsogbu n'ọnụ gụnyere nke a na-akpọ ""Oral psoriasis"" nakwa ""Oral cancer"". Nke a bụ mgbe ọnya na-agbakasị mmadụ n'ọnụ. Ị nwereike isi n'ụzọ ndị a lekọta eze gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-53350578 +entertainment Oliver de Coque,Osadebe na ndị otiegwu Igbo ọzọ kpọtụrụ akpọtụ n'afọ 60s rue 80s "Mgbe elu bụ ala ọsa, mgbe obodo Naijiria ka bụ ụtụ, ndị Igbo nwere ndị na-eti egwu, egwu ha na-ada ụda na Naijiria nakwa mba ofesi. Lee ụfọdụ n'ime ndị Igbo ji eje mba n'iti egwu bido n'oge Naijiria nwetachara 'Independence' na 1960 were rue afọ ndị dị n'agbata 1980: 1. Aha a gụrụ ya bụ Oliver Sunday Akanite, onye Ezinifite, Nnewi South, Anambara Steeti, mana ihe ụwa jiri mara otiegwu a bụ 'Oliver De Coque'. 2. Egwu o jiri pụta ọgbọ mbụ bụ Messiah Mesiah nke o wepụtara n'afọ 1977 mana egwu ya wuru ochie ochie bụ ""Peoples' Club of Nigeria, Opportunity, nakwa 'Funny Identity'. 3. Ọ lakpuru ọtụtụ afọ, anaghịkwa anụ olu ya mana ọ pụtakwara n'ike na ebube n'ebe afọ '1990s' oge o tipụtara egwu ndị a; Biri Ka Mbiri,"" ""Ana Enwe obodo enwe,"" ""Nnukwu Mmanwu."" 4. Oliver , onye nwụrụ n'afọ 2008 ka ọ gbachara afọ 61 bụ onye ndị ihe ya na-amasị na echeta maka etu o si mara akpọ ụbọakwara. 5. Ụfọdụ ụmụ ya gbasoro nzọụkwụ ya n'iti egwu mana o nweghị onye n'ime ha chakerela ka nna ha. Ụfọdụ egwu o tiri: A ma Stephen Osita Osadebe dịka otiegwu 'High Life' aha ya wuru ewu, ọ kachasị ka a lụchara agha dịka o tipụtara efere egwu 'Ọsọ ndị, O we ndị.' Mana o tiwelarị egwu kemgbe dịka odogwu ahụ a mụrụ n'afọ 1936 wepụtara efere egwu mbụ ya n'afọ 1958. Onye Atani n'Anambara steeti, Osadebe chị bụ ọgbọ na Legọs ebe o bi akụ egwu tupu a gbaa ọsọ Biafra. O sobu Eleazar Chukwuwetalu Arinze (E. C. Arinze), onye nwe 'Empire Rhythm Orchestra' (ma tipụtakwa egwu ,""N'ike N'ike ka anyị ji arụ ọrụ"" na ""Biko Rapum Paulina"") agụ egwu. E mechaa sonyere ""Central Dance Band"" nke Stephen Amaechi na-edu tupu o bido nke ya ọ kpọrọ ""Nigerian Sound Makers."" Otu onye egwu ndị ochie na-amasị bụ Ron Mgbatogu kwuru na ihe mere egwu Osabdebe ji wuo nnukwu bụ na ""Ọsadebe nwere etu egwu ya si ada ka egwu ndị ọgalanya, egwu ngala."" Ụfọdụ egwu o tiri: Emeka Morocco Maduka bụ otiegwu kajara akaja bidoro tiwe egwu n'afọ 1962 mana egwu ya bidoro wuwe ewu na 70s rue 80s. Onye Ukwulu dị n'Anambara Steeti Morocco tipụtara egwu ruru iri na asatọ maka nke kachasị ree ahịa bụ ""Asili '98"". Dịka o si gbaa n'ama, ọ bụ ọrụ igwe ọkụ (electrician) ka ọ na-arụ tupu ọ banye idi egwu. Maduka bụ otiegwu a ma ama n'ala Igbo maka egwu ekpili nke mere e ji akpọ ya ""Eze Egwu Ekpili"". Egwu ya na-enwe ezi nkuzi ma na-emetụta n'ọkpụkpụ. O tiela egwu afọ 60 tupu ọ nwụ n'ụbọchị 29 Ọktoba nke afọ 2020. Ụfọdụ egwu o tiri: Stephen Osita Amaechi bụ otiegwu e jiri 'highlife' mara ama. Ọ bụ ya nwe otu egwu ọ kpọrọ 'Afro-Rhythm Skies'. – Otu egwu ya bụ 'Afro Baby' Ndị mara maka ya kọwara na ọ bụ n'aka ya ka Osita Osadebe mụrụ iti egwu. Osadebe sonyekwara n'otu egwu ya tupu ọ malite nke ya. Mike Ejeagha bụ otiegwu Igbo a ma ama n’ihi egwu akụkọ ifo ya. Ọ bụ onye Eziagụ n'Enugwu steeti. Ya mere ọtụtụ Igbo ji ya ekwu okwu sị 'akụkọ na egwu Mike e ji Agha"" mgbe mmadụ kọwara ihe na-atọ ka akụkọ ifo. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nso nso, Ejeagha kwuru na ya bụbu ọkpụisi tupu ya abanye iti egwu. Na nkọwa Ron Mgbatogu, Ejeagha ""dịka onye toro n'aka ndị ochie"" nke mere ọ nụchara okwu amamihe ha were ya na-akụ egwu ma na-akụzikwara ndị mmadụ ihe. Ụfọdụ egwu o tiri: gawazịa Celestine Ukwu bụ otiegwu 'highlife' a ma ma bụ onye a mụrụ n-Enuwgu bụ onye ọzọ egwu ya kpọtụrụ akpọtụ n'ala Igbo nakwa na Naijiria n'agbata 60s na 70s. A mụnyere ya n'egwu dịka nna ya bụ otiegwu igede, ebe nne ya na-edu egwu n'otu egwu ụmụnwaanyị. Mgbatogu kọwara na Ukwu bụ onye e ji okwu miri emi , na olu dị ụtọ na ntị mara. O kwukwara na e ji ịkụ ngwa egwu a kpọrọ 'xylophone' nke o webatara n' egwu 'High Life''were mara. ""Ọ bụ onye jị gọọmenti na-akpọ ọ bịa tiere ha egwu."" ""Ka a lụchara agha, oge Ụkpabi Asika na-achị Eastern Region, a na-akpọkarị ya ma gọọmenti nwee emume. Celestine Ukwu nụrụ n'afọ 1977 n'ihe mberede okporoụzọ. Ụfọdụ egwu o tiri: Otiegwu Onyeka Onwenụ bụ onye Arondizuogu, n' Imo Steeti. Ọ gụrụ akwụkwọ n'Alabekee ebe ọ gụrụ na Wellesley College, Massachusetts dị n'Amerịka tupu ọ laghachị Naijiria bịa rụwa ọrụ. Ọ bụ onye ntaakụkọ lụrụ na ụlọntaakụkọ NTA n'agbata afọ 1980s. Ewezụga iti egwu bụ ihe e ji kacha mara ya, Onwenu bụ onye ihe ejije dịka o sonyerela mee ọtụtụ ihe ejije na Nollywood. Ejije ndị o merela gunyere; 'Widows'Cot', 'Rising Moon',Muna,The Tyrant 'Lion's Heart' wdg. Ụfọdụ egwu o tiri: Bright Chimezie bụ onye e ji 'Zigima Sound' bụ ụdị egwu nke ya nke dịkwa ka 'High Life' mara. Etu o si ete ụkwụ ma ọ na-agba egwu bụkwa ihe na-atọ ndị egwu ya na-amasị ụtọ. Ọ na-akọkwa akụkọ ije ụwa n'egwu ya. Ụfọdụ egwu o tiri: Nelly Uchendu bụ olu ọkwa n'ịgụ egwu chakere na 70s na 80s oge ụmụnwaanyi Igbo ịbụ otiegwu dịka ịnata iko e jiri kunye ya mmiri. Uchendu,onye a mụrụ n'afọ 1950 bidoro wube n'afọ 1976 oge o tipụtara egwu ọ kpọrọ ""Love Nwantịtị. Ihe e jiri mara Nelly bụ na egwu ya na-abụkarị okwu ndụmọdụ,nkụzi nakwa akụkọ ifo. O.nye Ụmụchu n'Anambara steeti,ọ lara mụọ n'afọ 2005. Ụfọdụ egwu o tiri Patrick Obasi,onye a ma ama dịka 'Patty Obasi' bụ otu onye na ndị bidoro egwu ụka na Naijiria. Egwu bupụtara nwaafọ Mmakụ(Enugwu Steeti) a bụ efere egwu mbụ ya bụ ""Mama Ịwọta"" nke pụtara n'afọ 1980. Ihe mere egwu Obasi dị iche bụ ụda ya. Njirimara Patty Obasi bụ na egwu ya na-ada nwayọọ nwayọọ, ebe mkpụrụ okwu so ya ga-akpọfeli onye na-ege ya dịka ọ na-ewelite mụọ. Ụfọdụ egwu o tiri: Ikoli Harcourt Whyte bụ onye Abonnema dị na Rivas steeti. Nwa afọ a mụrụ n'afọ 1905Ọ bụ onye nwere maasị n'egwu na ihe egwu site oge ọnọ n'ụlọ akwụkwọ. O butere ọrịa ekpenta n'afọ 1918, ọ bụ ka ọ a kpọgara ya n'ụlọ ọgwụ gọọmenti dị na Pọtakọt ka ya na ndị ekpenta ndị ọzọ gbakọrọ nwee otu egwu Bekee kpọrọ 'Choir'. E mechara buga ya n'ụlọọgwụ 'Uzuakoli Leprosy Hospital', dị na Bende ,Abịa steeti, ebe ọ nọrọ gbakpee ka ọ rịachara ọrịa ahụ afọ iri atọ na anọ. Egwu e jiri mara nwa afọ bụ 'Atula Egwu' bụ egwu ụfọdụ na-akpọkarị n'ala Igbo ma mmadụ nwụọ. Njirimara Harcourt , onye wepụtara abụ karịrị 200 bụ na ọ naghị e ji ngwa egwu agụ egwu ya. Na-agbanyeghị nke a, egwu ya na-emetụ n'ọkpụkpụ. ma na-agụ akwa mgbe ụfọdụ. Ụfọdụ egwu o tiri: E jiri 'Sir Warrior mara ya mana ezi aha ya bụ Christogonous Ezebuiro Obinna. Ya bụ nwaamadi bụbu onye ndu otu egwu 'Highlife' wuru na 70s a kpọrọ 'Oriental Brothers.' E mechara otu egwu ahụ gbasaa ụzọ atọ ;Prince Ichita& The Great Oriental Brothers,Oriental Brothers nakwa Sir Warrior &His Oriental Brothers. Oriental Brothers bụ otu egwu bidoro ka Agha Biafra biri n'Owere,Imo Steeti ebe ụmụokorobịa gụnyere Godwin Kabaka,Livinus Akuilo,Fred Ahumaraeze, Ferdimand Emeka Opara nakwa Christogonous Ezebuiro bụ 'Sir Warrior'. Ha nwere nghọtahie banyere etu egwu ha si ada nke mere ka onye bụbu onye ndu ha bụ Godwin Opara dọwara pụọ,bido 'Kabaka'. Livinus na Ichita mechara pụọ,ya afọdụ Warrior,onye kpokọbara ndị egwu ọzọ bido nke ya- Sir Warrior & His Oriental Brothers. Ihe e jiri mara nwoke Mbaise (Imo Steeti)a na egwu ya bụ ụbọakwara na okwu, 'Ọyọrịma' nke a na-ekwu na ọ bụ ya bidoro nakwa okwu miri emi. Ụfọdụ egwu o tiri:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-52064601 +entertainment Akụkọ kachasị taa: NYSC akọwala ihe mere Davido anọghị ebe ibe ya nọ "Ngalaba na-ahụ maka ife ala nna n'otu afọ bụ NYSC ekwuola na onye otiegwu bụ Davido naara ikike n'aka ha tupu ọ gaa njem na mba Amerịka. Nke a na-apụta dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-akatọ Davido maka ị gawa njem ọrụ na Amerịka oge ndị ogbo ya ji otu afọ efe ala ha ka nọ n'ogige NYSC. Onye ọrụ NYSC gwara BBC n'ekwentị na Davido nara ikike a maka nchekwa na mkpuchi onwe ya mgbe o denyerechara aha ka ibe ya. Ọzọ, Ndị uweojii na Anambra steeti anwụchiela mmadụ ise gụnyere nwata dị afọ iri n'anọ maka iwakpo nwaanyị uche ezughi ezu n'ụmụnze dị n'okpuruọchịchị Orumba South. Nwaanyị ahụ ihe metụtara bụ onye Arondịzuogu kwuru na ha tọrọ nwa ya nwoke dị afọ atọ. Na mba ofesi Ndị mmadụ na-egosi iwe ha na soshal midia maka na onye ọkpa ọchị bụ Kevin Hart machiri ekwenti na mmemme ya emere n'ụbọchị ụka na mba Briten. N'uche ha, Kevin Hart nke Amerịka mefere ya bụ ihe oke n'ịmachi ihe dịka ekwentị N'egwurewgu Serena Williams etozuola ị ga agba nka anọ n'asọmpị US Open dịka o meriri Kaia Kanepi nke mba Estonia taa. Aha ya na-ewu ugbua dịka Serena Odogwu na Tennis kwuru na ọ ka chọrọ imụta ụmu abụọ n'ọdịnihu n'agbanyeghị na ọ tara ahụhụ ị mụ nwa nke mbụ ya. Gee Nkeji nke mgbede a: Ihe onyonyo N'ụtụtụ Super eagles Taa bụ ụbọchị atọ nke ọnwa Septemba 2018 ka a ga-emepe ogige ebe Super Eagles ga-anọ mee nkwado maka izute Seychelles ịmata onye ga-etozu maka Iko mpaghara Afrịka. A na-atụ anya Henry Onyekuru, John Ogu, na ndị ọzọ. Ọdọ ụgbọelu Enugu Gọvanọ ndị si mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa na-akwa arịrị maka ọnọdụ ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'enugu nọ na ya ugbua. N'ọgbakọ ha mere n'ụbọchị abụọ nke ọnwa September, ha kelere gọọmentị etiti maka itinyebụ ya aka, ma kpọkuo mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu ka ọ bịa lee ọdọ ụgbọelu ahụ anya ma mezie ihe ndị e kwesịrị imezi na ya. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Bịanụ rụọ ọdọ ụgbọelu Enugu - Gọvano ndị ọwụwa anyanwụ Na mba ofesi, Ọkụ agbapịala ụlọ ebe a na-edebe ihe ochie dị na Rio de Janeiro, isi obodo mba Brazil. Onyeisiala ha bụ Michael Temer kwuru na ihe ọkụ mebiri n'ụlọ ahụ gbara afọ narị abụọ, bụ ""ihe furu efu Brazil enweghị ike ịgbakọ."" Atụmatụ gọọmentị Gọọmentị etiti amapụtala ijeri naịra anọ na iri isii na asatọ a ga-etinye n'ịrụ ụzọ Lagos-Ibadan, akwammiri Niger nke abụọ, ụzọ East-West, ụzọ Abuja-Kano nakwa ọrụ ọdọ mmiri Mambilla. Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji: Lee ihe nkiri nke taa: Nwaanyị mụrụ ejima anọ akọọla etu ya na di ya si chee afọ asaa tupu ihe iribeama a emee." https://www.bbc.com/igbo/afirika-45394206 +politics Hope Uzodimma ewetuola obi, gbatia aka udo "Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma ekwuola na ya ga-anabata mkparịtaụka ọbụla ga-ame ka tigbuo zọgbuo kwụsị na steeti ya. Gọvanọ Uzodimma kwuru nke a mgbe ọ na-agụpụta ozi emume ụbọchị ncheta nwereonwe Najirịa n'ụbọchị satọde bụ June 12, 2021. O kwuru na ọdịghị mma ka Imo steeti were obere akụ na ụba ha nwere na-ahazi nsogbu ogbaghara na-ebute maka nchekwa. Uzodimma kwuru na udo na-eweta ọganihu ya mere o ji di mma ka onye ọbụla tinye mma n'ọbọ ka e jiri nwayọ chọwa ihe dabara na mmiri. Cheta na kamgbe ọnwa atọ gara aga ka mkpa mkpa a ndị o ji egbe na-akpa n'Imo steeti. Mkpa mkpa a gụnyere ịgba egbe aghara aghara, ịmụnye ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ nakwa ụlọọrụ gọọmenti nakwa igbu ndị mmadụ ụfọdụ oge. Mmadụ atọ nwụrụ n'ọgbaaghara dapụtara n'Owerri ụnyaahụ Declan Emelumba bụ kọmishọna mgbasaozi n'Imo steeti, ekwuola sị ""nke a abụghị mbụ Primate Ayodele na-ebu amụma maka Gọvanọ Hope Uzodimma, mana enwebeghi nke mezurunu"". Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ naanị uche Chineke ga-eme oge ọbụla. Emelumba kwuru na ọ bụrụ na Ụlọikpe Ukwu mechaa kwuo na ha ga-elebanye ikpe ahụ anya ọzọ, na ha ga-adị njikere. Nke a na-abịa dịka Primate Elijah Ayodele bụ onyeisi ụlọụka INRI Evangelical Spiritual Church, buru amụma na ụlọikpe ga-enyochagharị ikpe Gọvanọ Hope Uzodimma. BBC Igbo kpọtụrụ Primate Ayodele dịka akụkọ na-efegharị na o kwuru na Ụlọikpe Ukwu nke Naịjirịa ga-achụpụ Uzodimma n'oche gọvanọ Imo steeti. Mana Primate Ayodele kwuru na enweghi ihe ọzọ o kwuru karịa na Ụlọikpe Ukwu n'oge na adịghị anya, ga enyocha ya bụ ikpe kpọbatara Uzodimma ọchịchị. O kwuru sị ka ""Uzodimma kee nkwụcha n'ihi na Ụlọikpe Ukwu ga-enyocha ikpe kpọbatara ya n'ọchịchị dịka Gọvanọ Imo steeti"". Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya na Uzodimma ekwubeghi okwu, na ọ hụtubeghikwa ya mbụ ma kwukwaa na ọ gatubeghi Imo steeti, nke pụtara na ọ bụghị mmegide ka ọ na-achọ imegide ya. Cheta na Fada Mbaka buru amụma na Uzodimma ga-enweta oche gọvanọ Imo steeti n'ọnwa Jenụwarị." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53833833 +business Ọgba Mbọ: Ịrụ ọrụ mesịn na-amasị m - Nwaanyị na-arụ mesịn Jane bụ ezigbote ọgba mbọ dịka ọ bụ nwaanyị ji ọrụ ido ụlọ na-azụ ezinaụlọ ya nri. Ọ sị na ọ bu ọrụ ọ hụrụ n'anya ma bụrụ ihe o ji obi ọcha arụ. N'ihe nkiri a, Jane kọwaara BBC Igbo etu o Jiri malite ọrụ a. O kwukwara na agbanyeghi na ụmụ ya asaa na di ya anwụọla, be ya juru eju, dịka o nwere mmadụ iri na ise ọ na-azụ na be ya. Ndị mere akụkọ a bụ Chioma Obianinwa na Nnamdi Agbanelo Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/51178112 +politics Presidential election Tribunal: Buhari emeriela Atiku n'ikpe onye meriri ntuliaka 2019 "Ụlọikpe akpụla akwụkwọ Atiku Abubakar gbara Buhari n'ụlọikpe pụrụ iche onye meriri na ntụlịaka onyeisiala Naijiria nke afọ 2019. Ndị ọkaikpe mmadụ ise nke onye ndu ha bụ Jọstịs Mohammed Garba kwuru na akwụkwọ akaebe niile ndị gbara akwụkwọ wepụtara iji kwado ebubo ha boro dịka na atụụ vootu karịrị ndị tụrụ ya egosighị. Ụlọikpe ekpebikwara na Inec ejighi ""server"" gbakọọ mpụtara ntuliaka ahụ n'akwụkwọ Atiku Abubakar nke PDP gbara Onyeisiala Muhammadu Buhari n'Abuja ụbọchị Fraide. Ụlọikpe kwukwara na Osinbajo ejighi ' Tradermoni' zụọ vootu ndị mmadụ ma kwụkwaa na Buhari gụ®ụ aakwụkwọ tozuru ịbụ onyeisiala Onye fere ọkọlọtọ ""People's Democratic Party"" (PDP) bụ Atiku Abubakar na ntuliaka ahụ gbaburu Onyeisiala Muhammadu Buhari akwụkwọ na-agbagha mpụtara ntuliaka ahụ e mere n'abali 23 nke ọnwa Maachi. Atiku sị na ọ bụghị Buhari nwe mmeri na ya bụ ntuliaka. Dịka ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (Inec) siri kwupụtabu, Buhari nwetara vootu dị 15,191,847 nke pụtara pasenti 56, ebe Atiku nwetara vootu dị 11,262,978 nke pụtara pasenti 41 vootu a tụrụ. Mana Atiku wepụrụ okwu ahụ ụlọikpe pụrụiche e hiwere maka ntuliaka ịgbagha ya bụ mpụtara. Atiku na pati ya bụ PDP boro ebubo na ha nwere ihe akaebe gosiri na e mere wuruwuru dị egwu na ntuliaka ahụ na mpaghara dị iche iche na Naijiria. Ha kporo oku ka a gbaa n'anwụ ngụkọ dị na 'server' Inec ka pati ọbụla mara ebe ha kwụ dịka ha na-ekwusi ike na ọ bụghị ihe Inec kwupụtara bụ ihe a tụtara na vootu. Presidential election 2019: Buhari achakeela ọzọ Ọzọ, Atiku gbaghakwara sị na Buhari enweghị agụmakwụkwọ tozuru ya ịbụ onyeisiala. Iwu Naijiria nke afọ 1999 akụkụ nke 131 kwuru na onye ga-abụ onyeisiala ga abụ : ""Onye gụrụ opekata mpe 'school certificate' maọbụ oyiri ya."" N'ụbọchị 21 nke ọnwa Ọgụstụ Ụlọikpe Ukwu Naịjirịa kagburu atụmatụ PDP inyocha igwe ""server"" Inec. Ndị Ọkaiwu ise nọ na ngalaba a Dattijo Muhammad bu onyeisi ha sị cha cha ma ncha na ha agaghị ekwe n'arịrịọ PDP na onye zọrọ ọchichị n'okpuuru ha bụ Atiku Abubakar maka ihe ndị ọzọ metụtara okwu ""server"" a. Na mkpebi ha, Ụlọikpe a sị na Inec agọọla na ha enweghị ""server"" ma kwukwa na ha ejighị usoro tecknuzu ọbụla kpokoo ọnụọgụgụ vootu gaa ""server"" ọbụla dịka PDP na Atiku siri kwuo. N'ikpe metụtara Buhari itozu ịzọ ọchịchị ụlọikpe Mkpegharị dị n'Abuja nọrọ n'ụbọchị Fraide bụ ụbọchị asaa nke ọnwa Ọgọstụ 2019 kụpụ n'akụkụ, akwụkwọ a gbara na-ekwu na Buhari agụrughị akwụkwọ ịbụ onyeisiala na ntuliaka 2019. Na mkpebi ụloikpe nke ọkaikpe atọ n'isi ya Jọstis Mohammed Idris kwuru na a gbara akwụkwọ ahụ mgbe ọ gaferela oge kwesịrị ka e weta ya bụ okwu n'ụlọikpe nke bụ abalị iri na anọ. Kalu Kalu, Labaran Ismail and Hassy El-Kuris gbaburu akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja iji gbaghaa na Buhari etozughị ịbụ onyeisiala. mana ụlọikpe ahụ kụpụrụ ya, ha were gbagharịa akwụkwọ ahụ n'ụlọikpe mgbegharị. Amabeghi ma nke ahụ ọ ga-emetụta ikpe nke taa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49654992 +business Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị agha mmiri jidere ahịa iwu osikapa na-abata Naịjirịa Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Anwụchiela mmadụ maka ọgbugbu eze ndị Ọgbọzinne Ndị uweojii n'Enugwu anwụchiela onye e kwuru gburu eze ndị Ọgbọzinne dị na Nkanu na steeti ahụ. Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Danmallam Mohammed kwuru na a nwụchiri nwoke ahụ bụ Chibuike Odoh onye Mgbuji n'Ehamufu site na nchọpụta ndị uweojii n'otu nchekwa ndị ọzọ. Naịjirịa Mmadụ ole chọrọ oche onyeisiala? Ntuliaka 2019 na ha ebiri ọkụ nwayọ nwayọ dịka otu onye ọzọ kwupụtakwara ebumnobi nke ya ịzọ ọkwa onyeisiala. Onye a bụ onye chịburu Kaduna steeti bụ Ahmed Makarfi. Ebe ọzọ na Naịjirịa Osikapa bụkwa ahịa iwu Ndị agha mmiri Naịjirịa kwuru na ha jidere ụgbọ mmiri na-ebubata ihe ruru akpa osikapa ruru puku abụọ site na mba Kamerun. Cheta na gọọmenti machiri mbụbata osikapa na Naịjirịa iji nye aka kwalite ọrụ ugbo ịkọ osikapa na Naịjirịa.enug Akụkọ mba ofesi Ụmụnwaanyị anabataghị ụfọdụ atụmatụ Trump gụnyere nwunye ya. Nwunye onye chịburu mba Amerịka bụ Laura Bush ekwuola okwu megide ọchịchị Trump maka atụmatụ ya gbasara ndị mbịambịa. Nwaanyị Bush kwuru na atụmatụ ahụ na-etisa ụmụaka na nne dịka nwunye Trump kwukwara ka di ya jiri obi ya na-ach���. N'egwuregwu, Asọmpi Iko Mbaụwa na-ebiri ọkụ. Dịka asọmpi Iko Mbaụwa ka na-aga n'ihu, mba England ga-ezute Tunisia na mgbede taa n'otu nke G. Brazil na Swizaland ji otu ọkpu goolu gbaa onwe ha onye laba onye laba ụnyaahụ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa: https://www.bbc.com/igbo/afirika-44517202 +entertainment Big Brother Nigeria: Mpi Tacha na Mercy sụrụ mere ka ndị mmadu na-ajụ ajụjụ Egwuregwu Big Brother Naija abaala n'egwu nchakasị anya ugbua. Nke kpụ ọkụ n'ọnụ ugbua bụ esemokwu dị n'etiti Tacha na Mercy. Ihe onyoonyoo gosiri ebe Tacha na Mercy na-aba mba na-akọkwa onwe ha ọnụ. Mercy kwuru na Tacha nwere ahụ na-esi isi ebe Tacha kpọrọ Mercy 'drop out' nke pụtara onye agụchaghị akwụkwọ. Tacha dọkwara Mercy aka na ntutu. Nke a mere ka ndị nkwado ha malite ịkọrịta onwe ha ọnụ na soshal midia. Nwaada akpọrọ Khloe, onye sonyere n'egwuregwu BigBrotherNaija n'afọ gara aga, tinyekwara ọnụ n'okwu ahụ. Khloe jụrụ Big Brother ihe kpatara o ji chụpụ ya na enyi ya nwoke bụ KBrule n'afọ gara aga. O kwuru na ihe na-eme ugbua n'ime ụlọ BBNaija karịrị ihe e ji chụpụ ya na Brule n'oge ahụ. Onye ọzọkwa tinyere ọnụ n'okwu ahụ bụ Uti Nwachukwu. Nwachukwu bụ onye tuuru ugo n'egwuregwu Big Brother Africa n'afọ 2010. Ọ jụrụ ma ọbụzịkwa ihe e kwuru ka a na-eme n'egwuregwu ahụ. Ndị ọzọ tinyekwara ọnụ na ya bụ okwu: @benjimoola kọwara etu ọgụ ahụ si bido: @Shirleytohcute1 gosiri foto mgbe Mercy gara ife ala nna ya iji gosi na ọbụghị 'drop out' dịka Tacha si kwuo. MannyTeju kwuru na e kwesịrị ịchụpụ Tasha maka ịdọ Mercy aka na ntutu isi. Cheta na n'ụtụtụ Fraịde, a chụpụrụ Cindy na mberede. Ebuka onye nhazi egwuregwu BBNaija batara n'ime ebe a nọ eme egwuregwu ahụ wee sị Cindy ya kwara lii. Egwuregwu BBNaija ga-abịa n'isi njedebe n'ọnwa Ọktoba. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-49855498 +entertainment Regina Daniels Vs Jaruma: Ụlọikpe enyela iwu ka a nwụchigharịa Jaruma "Ụlọikpe nke Abuja enyela ntụziaka a hụ Hauwa Saidu a ma ama dịka Jaruma sị jide ya dịka nwa ada ahụ apụtaghị n'ụlọikpe taa n'ikpe ya na Ned Nwoko. Ọkaikpe bụ Ismail Abdullahi Jibrin nyere iwu ka ndị uweojii nwụchigharịa ya ma jide ya ruo abalị 17 nke ọnwa Maachị afọ 2022 bụ ụbọchị e higharịrị ikpe ya. Nke a bụ n'ihi na iwe gbara ọkaikpe na Jaruma na Ọkaiwu ya abịaghị ụlọikpe nke ha na-ezite n'ụlọikpe dịka e nwere ikpe ha ụbọchị Wenezde. Ndị uweojii kpụpụrụ Jaruma, onye na-ere ọla aka na ngwa ụmụnwaanyị, ụlọikpe maka ebubo metụtara mmetọ aha Ned Nwoko bụbụ onyeomeiwu. Nghọtahie dabụtara n'etiti Jaruma na nwunye Nedu Nwoko bụ onye ejije a ma ama bụ Regina Daniels. Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka a tọhapụ Hauwa Saidu Mohammed, onye e ji Jaruma mara, n'okwu dị n'etiti ya na ọkaiwu a ma ama bụ Ned Nwoko Ọkaikpe Ismail Abdullahi Jibril nyere iwu a n'ehihie Fraịde, Jenụwarị 28, ma kwuo ka Jaruma kwụọ ego dị Puku Narị naịra ise (N500,000). O nyekwara iwu ka Jaruma kpọta otu onye ga-ana ya n'akaebe. Onye ahụ ga-abụ onye ọrụ oyibo nọ n'ogogo 'Level 12', biri n'Abuja, ma wetakwa ego dị N500,000. Regina Daniels na Jaruma dịbu na mma dịka ha si egosibu n'akara 'Instagram' ha. Mana ọ dịka e nwere nghọtahie dapụtara n'etiti ha n'ihi azụmahia. Jaruma boro ebubo na Regina Daniels riri ego ya dị nde naịra iri (N10m), mana ọ rụghị ọrụ ọ sị ya rụọrọ ya. Regina n'aka nke ya kwuru na ya mere ihe ya na Jaruma kwekọrịtara, mana Jaruma chọrọ ihe ọzọ. Etu Ned Nwoko si bata n'okwu ahụ bụ maka ebubo Jaruma boro gbasara nkewa ya na otu n'ime ndị nwunye ya. N'ihe o dere n'akara 'instagram' ya n'abalị Tọzde, Jenụwarị 27 2022, Regina Daniels kọwara na ọ rụrụ ọrụ Jaruma kwụrụ ya ụgwọ ka ọ rụọ, mana Jaruma chọrọ ka o meere ya ihe ndị ọzọ bụ nke ya onwe jụrụ ime. O kwuru na ụfọdụ ihe ndị ahụ Jaruma chọrọ ka ya mee metụtara di ya bụ Ned Nwoko, mana ọ gwara ya ka o wepụ aha di ya na mkparịtaụka ha abụọ. ""Nkwekọrịta mụ na Jaruma nweburu bụ naanị ka m tinye ahịa ya n'akara 'Instagram' nke m, mana ọ bịara chọwazie ka m na-aụta n'onyonyo ebe m na-eyi ụfodụ ihe ndị ọ na-ere,"" Regina kwuru. ""Jaruma mebiri adịmnamma mụ na ya oge o kwuru na ọ bụ mụ kpatara nnukwu ọgbaaghara dị n'ezinụlọ m. Ezigaara m ya ozi ka o wepu ihe ahụ o dere mana o wepụghị ya."" Regina kọwara na nnwuchi a nwuchiri Jaruma nakwa mkpọrọ a tụrụ ya agbasaghị nkwekọrịta ha abụọ nwere, kama ọ bụ maka akụkọ ụgha niile Jaruma na-agbasa megide di ya bụ Ned Nwoko. N'ọtụtụ ihe o dere nakwa onyonyo o tinyere n'akara 'Instagra' ya, Jaruma boro ebubo na Regina Daniels riri ego ya. N'akara Instagram ya n'ụbọchị Jenụwarị 22, Jaruma dere ihe ma kwuo sị: ""Ha gbalịrị iji ndị uweojii mba Dubai nwụchie m, mana ọ gazighịrị ha n'ihi na ndị uweojii Dubai ma na aka m dị ọcha."" ""Ụmụaka abụọ na-ese okwu, okenye nwoke dị afọ 74 bịa buru onwe ya tinye n'ime ya, were ndị uweojii Naịjirịa na-emekpa m ahụ."" Jaruma akpọghị Ned Nwoko aha n'ihe ahụ o dere, mana o tinyere foto ya na Ned nakwa Regina sere n'oge gara aga. Ọ gara n'ihu tinye onyonyo ebe o kwuru na e nwere otu nwoke akaọrụ ya bụ iji akụnụba ya na-emegbu ndị ntorobịa Naịjirịa. Ọ sị: ""Oge ọbụla e tinyere aha mmadụ na 'Google', ihe a ga-ahụ bụ naanị aha ndị mmadụ ọ kpọchiri na mkpọrọ. Ọ chọrọ ka anyị tụwa ya ụjọ?"" Jaruma akpọghịkwa Ned Nwoko aha n'onyonyo ahụ, mana ọtụtụ ndị mmadụ kwuru na o ji ụzọ aghụghọ atufere ya okwu. Okwu a malitere oge otu n'ime nwunye Ned Nwoko aha ya bụ Laila Charani, onye mba Morocco, kwuru na ya na Ned ekewaala. Ndị mmadụ malitere ikwu na ọ bụ ike dị na 'kayanmata' Jaruma na-ere mere Laila na Ned ji gbaa alụkwaghị m. Ha kwuru na ọ bụ 'kayanmata' Jaruma ka Regina Daniels ji chụọ Laila Charani. Mana Regina were iwe ma kwuo na ọ bụ eziokwu na ọ na-etiri Jaruma mkpu ahịa n'oge mbụ, mana onweghị ihe gbasara ya na 'kayanmata' ọ na-ere. N'ọnwa Nọvemba 2021, Ned Nwoko bụ di Regina Daniel sara Jaruma okwumaka ebubo na ọ bụ 'kayanmata' ka Regina ji jide ya. Mana o mechara wega mkpesa n'aka ndị uweojii megide Jaruma. N'akwụkwọ ebubo Ned degaara onyeisi ndị uweojii n'Abuja, o boro Jaruma ebubo ndị a: Oge okwu ahụ pụrụ n'ụlọikpe, Jaruma kwuru na ikpe amaghị ya. Ọkaiwu Jaruma bụ James Odibe gwara ụlọikpe ka a tọhapụ ya, mana ọkaikpe yigharịrị ikpe ahụ ka ọ dị n'ụbọchị Fraịde, abalị iri abụọ na-asatọ nke ọnwa Jenụwarị. Ọkaikpe nyekwara iwu ka e debe Jaruma n'ụlọ mkpọrọ dị na Suleja rue ụbọchị ahụ a ga-ekpe ikpe iji gbapụta ya. Dịka ọkaiwu Ned Nwoko si kwuo, ndị uweojii kpọrọ Jaruma n'ụlọọrụ ha n'ụbọchị Fraịde, abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Jenụwarị, mana oge ha hụrụ na ọ kpọ nwa ya bịa, ha gbachara ya ajụjụ ọnụ ma hapụ ya ka ọ laa. N'ụbọchị Mọnde, Jenụwarị 24, ka e wepụrụ okwu ahụ n'ụlọikpe, ebe ọkaikpe nọrọ nye iwu ka e jide Jaruma n'ụlọ mkpọrọ ruo ụbọchị Fraịde, Jenụwarị 28, oge a ga-ekpebi ikpe mgbapụta ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60152896 +business Ọgba Mbọ: Ọtụtụ ndị enyi m gbara m ọsọ maka na m na-ebu ozu - Adaeze Okosi "Adaeze Okosi bụ otu n'ime ndị ntoroọbịa gụchara mahadum na Naijirịa ma ha enwewghị ọrụ. Kama Adeze onye gụrụ 'Anatomy' na Mahadum malitere tinyewe ihe ọ gụrụ na mahadum n'ọrụ; o bidoro ịnya ụgbọala eji ebu ozu. Abia na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijirịa, ịnya ụgbọala eji ebu ozu nke bụ Hearse n'okwu bekee bụ ọrụ a na-ahụ dịka ọrụ ụmu nwoke. Kama nke a egbochighị Adaeze ịbanye ya bụ ọrụ ma na-eme ya nke ọma. Adaeze kwuru na ọtụtụ ndị enyi ya gbaara ya ọsọ kamgbe o bidoro ịnya ụgbọala eji ebu ozu. O kwukwara na nne na nna ya kwadoro ya kama na ụfọdụ ndị mmadụ anaghị ekwe enye ya ọrụ maka na ọ bụ nwaanyị. Ụfọdụ na-ekwu na oge ụfọdụ ndị mmụọ na-enye ndị na-anya ụgbọala e ji ebu ozu nsogbu, mana Adaeze kwuru na ụdị ihe ahụ emetụbeghị ya. ""Enwebeghị mgbe ụdịrị ahụmihe dị otu a kamgbe m malitere ọrụ a,"" Adaeze kwuru. ""Ana m arụ ọrụ m, gaa ụka, ma bidokwa ọrụ m ọzọ. Anaghị m ahụ ihe ọbụla dịka ndị mmụọ maọbụ ihe gbara gharị"". Adaeze kwuru na ya malitere ọrụ a na mbido afọ 2022 ma kwukwaa na ọ na-enyere ya aka. Ọ bụ Chigozie Ohaka na Chiemela Mgbeahuru mere akụkọ a" https://www.bbc.com/igbo/61463782 +sports Tokyo Olympics: Ihe Naịjirịa mere m n'Olympics gbawara m obi - Cici Onyekwere Cici Onyekwere bụ ejima atọ egwuregwu na-amasị. O ritere ntụrụugo na Discus mgbe ọ na-anọchi anya mba Naịjirịa. Ọ kọwarala BBC Igbo mwute ya mgbe ewepụrụ ya na mmadụ itoolu ndị ọzọ n'asọmpị Olympics ahụ. Gee okwu ya n'uju Ọrụ a si n'aka Jessica Nwankwo na Chiemela Mgbeahuru. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58301062 +religion Ramadan Kareem: Ihe mere ụfọdụ ndị Igbo ji nabata okpukperechi 'Islam' "Dịka ụfọdụ ndị okpukperechi nke Alakụba nke bụ 'Islam' na Bekee na-eti mkpu na a na-akpagbu ha n'ọwụwa anyanwụ ọkachasị oge ngagharịiwe Endsars. Ọtụtụ ndị mmadụ am,aghị etu maọbụ mgbe ha siri bata ala Igbo. Dịka igbo si atụ n'ilu sị ""Onye na-amaghị ebe eliri ozu na esi n'ụkwụ abọ ya"", nke a mere ka anyị zọpụ ije ị mata etu okpukpere Alakụba siri bata ala Igbo. BBC garụr�� n'ụlọakwụkwọ maka okpukperechi Alakụba nke dị n'Afikpo, Ebonyi steeti ka ha kọwaara anyị etu ya bụ ofufe siri bata ala Igbo. Ọ bụ Issa Friday Okonkwo bụ onyeisi nchịkọta ụlọakwụkwọ maka okpukpere Alakụba nke dị na Ebonyi steeti na Imam nke Owerri Shell Camp Central Mosque Imo steeti bụ Suleiman Yusuf Njoku tinyere ọnụ n'okwu a. Kedụ etu Alakụba siri bata ọwụwa Anyanwụ? Okpukperechi Islam nke ndị Igbo na-akpọ Alakuba abụghị taa ka ọ bidoro n'ala Igbo. Aha Alakuba sitere na ""Allah Hu Akbar"" nke pụtara Chukwu Ebuka n'asụsụ Igbo dịka Onyeisi ndị Imam nke Owerri Shell Camp Central Mosque Imo steeti bụ Suleiman Yusuf Njoku siri kọwaa. Njoku kwukwara na ya bụ Okpukpere sitere na onye ndị ofufe ahụ kwenyere na ọ bụ ozi nke ikpeazụ Chineke sitere bụ Abū al-Qāsim Muḥammad ibn ʿAbd Allāh ibn ʿAbd al-Muṭṭalib ibn Hāshim (Britannica). Kama ọ bụ Muhammad ka ọtụtụ ndị mmadụ ji mara ya. Ngwa ka anyị banye akụkọ a n'uju. Mazi Yusuf Njoku kọwara sị ""ọ bụ n'ihe dịka afọ otu narị na iri ise na atọ ka Alakuba batara ala Igbo"". Ọ kọwara na ọ bụ Nwaafọ Nsukka nke dị n'Enugwu steeti bụ onye nwanne ya nwaanyị kpọrọ gaa ugwu awụsa oge ọ dị na nwata bụ onye jiri Okpukpere Alakuba were bata Ala Igbo. Issa Friday Okonkwo kọwara sị ""ọteela aka ofufe Islam jiri bata ala Igbo, ọtụtụ ndị mmadụ amaghị nke mere na ọtụtụ ha anaghị ekweta"". Okonkwọ kọwara na ofufe nke Islam bu ofufe nke Kraịst ụzọ bata n'ụfọdụ ebe n'ala Igbo. O kwuru na ụfọdụ ebe n'Enugwu steeti dịka Enugwu Ezike, Ịbagwa Aka, Alaagu nke dị n'obodo Nsụkka bụ obodo ụfọdụ okpukpere Alakụba bu ụzọ bata tupu nke Kraịst abata. Okonkwo kọwara na ọ bụ site n'azụm ahịa n'etiti obodo ndị a na ụfọdụ mpaghara nke ugwu kpatara ya. Mpaghara ugwu dịka Nupe, Kogi na Sokoto bụ ndi ha na obodo ndị a zụkorọ ahịa. O kọwara sị "" Ọ bụ etu ndị a sị ebi ndụ nke ziri ezi mere ka ndị obodo ndị a jụwa maka ndị ha bụ na okpukpere chị ha"". Okonkwo kwuru na ọ bụ nke a mere ka ụfọdụ ndị obodo a gbanwee okpukpere chi ha ma zoro nke Alakụba. O mere ka anyị ghọta na ọ bụ etu a ka okpukpere Alakụba siri gbasaa ruo ọtụtụ obodo n'ala Igbo ma ruo kwa taa. Ọ kọwara na ebe dịka Enọọhia na ụfọdu ebe ka nsụka ka ị ga-ahụkarị ọtụtụ ndị ofufe Alakụba. Ọ bụ Sheik Ibrahim Nwagui bụ onye mbụ webatara Alakụba n'Afikpo. Kedụ onye na ebe o bu ụzọ bata n'Ọwụwa Anyanwụ? Issa Friday Okonkwo kọwara na ọ bụ n'oge afọ ndị 1800 ka Islam batara ọwụwa anyanwụ. Okonkwo kwuru na n'ebe dịka obodo Abiriba na Afikpo bụ n'afọ ndị 1930 na 1940 ka ọ batara obodo ndị a. Kama o kwuru na ọmaghị onye bu ụzo webata ya n'obodo Nsụka kama o kọwara na ọ bụ Sheik Ibrahim Nwagui bụ onye webatara ya n'Afikpo. Ọ kwukwara na ọ bụ na Nsụkka ka okpukpere alakụba bu ụzọ bata ọwụwa anyanwụ. Akụkọ kacha sie ike bụ na ọ bụ n'Obodo Alaagu ka e nwere ndị mbụ bụ ndị Igbo bụ kwa ndị Alakụba. Okonkwo kwuru sị, ""Akụkọ kwukwara na ụfọdụ ndị a bụ ndị Alakụba gwara ndị enyi ha nọ obodo ndị ọzọ maka okpukpere Alakụba, mgbe ndị enyi ha nyochara agwa ha, ụfọdụ gbanwere ma soro okpukpere alakụba. Mazi Okonkwo zara sị, ""Eeee, mgbagbu ndị mbụ bụ ndị alakụba dị njọ"". Ọ kọwara na mkpagbu a ka na-aga n'ihu ma ruo taa. Okonkwo rụtụ aka were sị ""n'oge agha Biafra, ndụ Igbo bụ ndị Alakụba lụụrụ Biafra ọgụ n'ihi na ha kwenyere na ha bụ ndị Igbo"". O kwukwara na oge alụchara agha, na egburu ụfọdụ n'ime ha n'ihi na ndị obodo ha kwenyere na ha na ndị agha Naijirịa bụ ụmunne. Okonkwo kwuru si, "" Ndị kacha bụrụ ndị udo n'ala Igbo bụ ndị okpukpere nke Islam""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-55208557 +politics Peter Obi's Economic Model: Ndị katọrọ atụmatụ Obi maka China amakụọla ya ugbua? Aka chịburu Anambara Steeti bụ Peter Obi bụ okwu a kpụ n'ọnụ na soshal midia 'Twitter' n'ụbọchị Tuuzde. Nke a bụ n'ihi atụmatụ gọọmentị etiti wepụtara nke kwuru na ha ga-agbali iwulite akụnaụba Naịjiria dịka nke mba Chaịna. Okwu a mere ka ọtụtụ mmadụ cheta ihe Obi kwuru ọge a na-akwado maka ntuliaka nke onyeisiala e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ 2019. Obi na Abubakar Atiku so zọọ ọkwa onyeisiala na osote onyeisiala n'aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party'. N'oge ahụ, Obi kwuru na ya Atiku ga-eme ka akụnaụba Naịjiria dị ka nke mba Chaịna ma ọ bụrụ na ha merie. Ebe ọbụla ọ gara ikwu okwu n'oge ahụ, Obi na-eji mba Chaịna eme ihe ọmụmaatụ. Nke a mere ka ụfọdụ ọtụmadị ndị otu APC gụnyere onyeisioche ha bụ Adams Oshiomole malite ịkpọ Obi 'Maazị Chaịna.' Ụfọdụ ha na-ekwu na Obi kwesịrị ikwu ihe gbasara Naịjiria hapụ Chaịna. Mana dịka gọọmentị Muhammadu Buhari malitere ikwu okwu gbasara Chaịna ugbua, ndị mmadu na-ekwuzi na ihe Peter Obi kwuru mgbe gara aga bụ eziokwu. Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed gwara ndị ntaakụkọ ụbọchị Mọnde na gọọmentị ga-ehibe ihe Bekee kpọrọ 'Special Economic Zones' na mpaghara isii nke Naịjiria dịka ọ dị na mba Chaịna. Lee ụfọdụ ihe ha kwugasịrị: @firstladyship nakwa @mydeji247 kọwapụtara Mana @otamssweet kwuru na ihe Zainab Ahmed kwuru dị iche na ihe Peter Obi kwuru. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/49734138 +religion Hyacinth Alia: Bishọpụ achụọla ụkọchukwu Katọlik na-azọ Gọvanọ na APC ọsọ "Bishop ụka Katọlik nke dayọsis Gboko bụ William Avenya enyela Fr Hyacinth Alia ntaramahụhụ site n'ịkwụsị ya ọrụ dịka ụkọchukwu. Nke a bụ maka na Fr Hyacinth Alia sonyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressives Congress (APC) ma gbata akwụkwọ iso zọọ ọkwa Gọvanọ nke Benue Steeti. N'akwụkwọ ozi si n'aka Bishọpụ Avenya, ọ kọwara na o megidere iwu ụka Katọlik onye ụkọchukwu ịbanye otu ndọrọndọrọ ọchịchị. O kwukwara sị na nkwụsị ọrụ a ga-adịgide ruo mgbe ụkọchukwu ahụ tụgharịrị ma kwụsị ịzọ ọkwa a ọ na-azọ. Fr Alia ịbanye otu APC ma na-azọ ọkwa gọvanọ, bụzị nnọọ okwu a kpụ n'ọnụ na Benue Steeti ugbua. Ya bụ ụkọchukwu agbatalarị akwụkwọ mmasị na pati APC. Cheta na ndị APC kwuru na akwụkwọ mmasị iso zọọ ọkwa Gọvanọ na pati ha bụ nde naịra iri ise (N50 million) ka ha na-ere ya. Okwu a na-agba ọtụtụ mmadụ gharịị maka na iwu ụka Katọlik machiri ndị ụkọchukwu ịbanye otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla. Ọtụtụ na-ajụ ajụjụ ebe ya bụ ụkọchukwu si weta nde naịra iri ise oji zụta akwụkwọ mmasị ndị APC, n'agbanyeghị na ọ naghị arụ ọrụ. Mana ụfọdụ ndị ọzọ na Benue Steeti na-ekwu na obi dị ha mma etu ụkọchukwu a si pụta ịzọ ọkwa ọchịchị. Otu onye na mpaghara ahụ aha ya bụ Desomnd Amanyi gwara BBC Igbo na ụkọchukwu Hyacinth Alia nwere ọtụtụ ndị nkwado. O kwuru na ọtụtụ na-enwe aṅụrị dịka ọ pụtara ịzọ ọkwa gọvanọ na Benue Steeti. ""Ọ bụrụ na o merie ntuliaka imeụlọ ndị APC mụ onwe m ga-atụnyere ya vootu,"" Amanyi kwuru. ""Maka na ọchịchị ọjọọ akarịala na steeti anyị. Ọtụtụ mmadụ nwere nchekwube n'ebe ụkọchukwu a nọ."" Gbasara etu o si nweta nde naịra iri ise o ji zụta akwụkwọ mmasị ndị pati APC, Amanyi kwuru na o chere na ọ bụ site na nkwado ndị mmadụ. O kwuru sị: ""Ụkọchukwu a abụghị obere mmadụ na Benue Steeti, ọ bụ nnukwu onye a ma ama. Ọ gbaghị m gharịị na ndị mmadụ nwereike ịkwado ya ịzụta ya bụ akwụkwọ."" Nke a abụghị nke mbụ onye ụkọchukwu Katọlik na-azọ ọkwa ọchịchị na Naịjirịa. N'afọ 1992, ụkọchukwu aha ya bụ Moses Orshio Adasu, zọrọ ma merie ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Benue Steeti. Ọ bụ ụkọchukwu Adasu bụ Gọvanọ nke abụọ na Benue Steeti banyere n'ọchịchị site n'usoro ntuliaka. O meriri ntuliaka ya n'otu 'Social Democratic Party' (SDP), ma chịa Benue Steeti ruo afọ 1993 oge ndị agha weghaara ọchịchị n'ike na Naịjirịa. Moses Adasu lara mmụọ n'ụbọchị 20 nke ọnwa Nọvemba afọ 2005." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61527286 +business Coronavirus Lockdown: Ihe mere anyị ji kpọpee Legos - Gọvanọ Sanwo-Olu Legọs bụ steeti ọrịa coronavirus kacha akpa ike na Naịjirịa. Ọrịa a egbuola ihe karịrị mmadụ iri atọ na steeti ahụ, ebe ihe karịrị mmadụ narị asatọ ka bu ya. Nke a mere gọọmentị ji kpọchie elu na ala ma tie iwu ka onye ọbụla nọrọ n'ime ụlọ ya. Mana ka izuụka isii gachara, gọọmentị nyekwara iwu ka a kpọpee obodo ka ndị mmadụ malite kpagharịwa ntakịrị ntakịrị. Ha mere nke a n'agbanyeghi na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus ka na-agbali elu. Aka na-achị Legọs bụ Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu kọwara na ọ bụ n'ihi akwa agụụ ndị mmadụ na-ebegara gọọmentị so na ihe mere ha ji sị ka a kpọghetụ obodo obere. Gere mkparịtaụka ya na BBC n'ihe nkiri dị n'elu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52566710 +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Brazil na Meziko na ndị ọzọ ga-asọmpi taa Ndị ga-ama aka mgba n'asọmpị iko mba ụwa taa N'asọmpi Iko Mbaụwa, ndị ga-asọmpi taa bụ Brazil na Meziko n'elekere atọ nke ehihie. Beljọm na Jaapan ga-asọ mpi ha n'elekera asaa nke abalị a. Obi ka na-agbawa ndị na-akwado Spen makana Rọshịa agbapugo ha na ya bụ asọmpi. Rọshịa jiri ọkpụ goolu anọ a satara atọ wee merie Spen na penariti. Onya na onye ga-asọ mpị na Wimbledon taa? Roger Federer na Dusan Lajovic ga-asọ mpi n'egwuregwu tennis nke a kpọrọ Wimbledon Open taa. Akụkọ na-ekwu ugbua na ọ dịka Serena Williams ga-eso n'asọmpi ahụ. Akwụkwọ ntuliakaadigboroja ọpụtaala? Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC ekwuola na ha na-enweta akụkọ gosiri na o nwere ndị chọrọ ime akwụkwọ ntuliaka adigborojaa na-ere n'elu intaneti. Inec kwuru na ha na ndị nchekwa obodo dị icheiche na-enyocha akụkọ a ugbua. Gọọmentị Legos steeti enyeela ndị na-anya ụgbọala na-ebu mmanụ ugbọala ụbọchị iri atọ ịnata akwụkwọ gosiri na ụgbọala ha na-aru ọrụ nke ọma. Mkpebi a bụ maka ihe mberede mere n'izu uka gara aga oge otu ụgbọala bu mmanụ gbara ọkụ ma gbuo mmadụ itoolu n'akwa mmiri Otedola n'ime Legos steeti. Lee onyeisiala ọhụrụ nke ala Meziko Andrés Manuel López Obrador ga-abụ onyeisiala Meziko ọhụrụ. Ndị ọrụ ntuliaka kwuru na ha ka na-agụ akwụkwọ mbinye aka mana Obrador ejirila ọkara merie na nke ha gụrụ ugbua. Gee nkeji anyị n'ụtụtụ a https://www.bbc.com/igbo/44680175 +entertainment Igbo foods: Ihe mere anyị ji ericha nri tupu anyị ataa anụ Anụ bụ otu n'ime ihe ndị dị mkpa na nri mmadụ na-eri ma na-enye akụrụngwa ndị dịka 'protein', abụba na mmiri n'ahụ mmadụ. O nwere obi ụtọ pụrụiche ndị mmadụ na-enwe ma anụ dị na nri ha na-eri, ọkachasị anụ gbara ọkpụrụkpụ. N'ihe onyonyo a, ndị mmadụ kọwara ihe mere ha ji ata anụ ma ha richa nri kama ịta ya tupu mọabụ dịka ha na-eri nri. Kirie ihe kwuru. https://www.bbc.com/igbo/afirika-49310418 +health Hand Sanitizer: Lee etu ị ga-esi rụpụta nke gi Mmadụ idebe aka ya ọcha bụ ụzọ kacha dị ire iji gbanahụ ọrịa na-efe efe dịka coronavirus. Mmiri nkwọcha pụrụ iche Bekee kpọrọ 'hand sanitizer' dị nnọọ nnukwu mkpa ugbua. 'Hand sanitizer' na-adazi oke ọnụ n'ahịa ugbua. Mana egwu atụla gị, lee etu i nwere ike isi rụpụta nke gi na-emefughi nnukwu ego. Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Vining Ogu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-52024159 +health Ụmụụwa atụkwasara ọgwụ mgbochi obi? "Ndị ọkammụta ahụike na-ekwụ na ntụkwasị obi ndị mmadụ nwere n'Ndị ọrụ ọgwụ mgbochi na-anazị azụ. Na nchọcha ndị ọrụ Wellcome Trust mere, ha ji ikpo mmadụ dị 140,000 sị mba dị 140 were mee ya. Nke a mere ka ndị WHO huta ileli ọgwụ mgbọchị dịka ihe iri so na-echere ahụike mbaụwa aka mgba. Wellcome Global Monitor ji ikpo mmadụ nọchitere anya mba 142 mee nchọcha gbasara: ntụkwasa obi na sayensi; ndị sayensi na okwu ahụike, ịmata ka ndị mmadụ sị ghọtatụ maọbụ nwee mmasị na sayensi na ahụike; ya na ka esi ahụ ọgwụ mgbochi. Nyocha a gosiri na ọtụtụ mmadụ enweghị ntụkwasi obi na ọgwụ mgbochi. Lee ihe ha zara ka ajụrụ ha ka ọ dị mma ịgba ọgwụ mgbochi: Mgbe ajụrụ ha ka ọgwụ mgbochi adị ire: Enwere ihe nchọcha na-enweghị mgbagha na ogwụ mgbochi bụ ụzọ ka dị ire n'igbochi ọrịa were ike igbunyu mmadụ anya dịka arụrụbara. Ọgwụ mgbochi azọọla ijerị mmadụ ndụ n'ụwa. O melala otu ọrịa - kitikpa - ma na-ewetakwa anyị nsọ n'imela ọrịa polio. Mana ọrịa ndị ọzọ dịka arụrụbara sịrị ọnwụ na-alọhachite nke ndị ọkammụta sị na ọ bụ maka na ndị mmadụ enweghị ntụkwasa obi n'ebe ọgwụ mgbochi nọ, egwu na akụkọ abụghị eziokwu kpara ya. Dọkịnta Ann Lindstrand bụ ọkammụta n'ọgwụ mgbochi nke WHO sị na ya bụ okwu taraakpụ ka ọ dị ugbua. ""Agbaghị ọgwụ mgbochi na-adọhachi ịnweta ahụike zuruoke azụ na mbaụwa"" . ""Any resurgence we see in these diseases are an unacceptable step backwards."" ""A gaghị anabata ndọchi azụ ọbụla n'ụzọ ọbụla."" Mba ndị bịara nso n'ikpochapụ arụrụbara ebidola ịhụ ya bụ ọrịa ọzọ. Ngụkọ gosiri na ọrịa ahụ ebirila ọkụ n'ihe ruru mpaghara ụwa niile ebe o ji pasentị iri atọ rịa n'afọ 2017 karịa 2016. Ọjụjụ ịnata ọgwụ mngbochi maka ihe ọbụla na-etinye onye ahụ na ndị ọzọ na nsogbu ịbute ọrịa. Ọtụtụ mmadụ nata ọgwụ mgbochi a, ọ ga-akwụsị ọrịa ahụ ife ndị ahụ - ihe Bekee kpọrọ ""herd immunity"". Imran Khan nke Wellcome Trust kwuru: ""Ọ dị anyị mkpa ugbua maka ọrịa arụrụrbara, mkpuchi ọbụla pekarịrị pesentị 95 ga-ebute ọrịa ahụ ife efe."" Ọtụtụ ndị bi n'ebe ndị dị nta n'obodo kwenyere na enweghị egwu di na ọgwụmgbochi. Ọnụọgụgụ ndị dị otua karịrị na ndịda Esia ebe mmadụ dị pasentị 95 kwenyere, nakwa n'Ọwụwaanyanwụ Afrika, ebe ọnụọgụgụ ha dị pasenti 92. Mba Bangladesh na Ruwanda fọdụrụ obere ka mmadụ nile kwere na ọgwụmgbochi enweghi egwu ọbula di na ya ma na-arụkwa ọrụ, ọnụọgụgụ ndị gbarala ọgwụmgbochi n'obodo ndị ahụ buru ibu na-agbanyeghi nhịahụ a na-enwe ime ka ha ruo ndi mmadụ aka. Ruwanda bụ mba nke izizi na-etolite etolite mere ka ọgwụmgbochi HPV nke e ji egbochi ọria cervical cancer ruo umunwanyi obodo ahụ nile aka. Mazi Khan kwuru: ""Nke a na-egosi ihe anyi nwere ike imenwu ma anyi gbalisie ike ikwalite ọgbụgba ọgwụ mgbochi"". Na nchọpụta ahụ, ndị nwere ntụkwasa obi n'ebe ndi dibia bekee, ndị nọọsu nakwa ndị sayentists nọ, na-aka ekwenye na onweghị egwu ọbụla dị na ọgwụmgbochi. N'aka nke ọzọ, ndị na-ekwenyechaghị na ọgwụ bekee nakwa sayensị, anaghị ekwenye n'ọgwụmgbochị. Akwụkwọ nchọpụta ahụ a kpọrọ 'Wellcome' agazighi nyochaba ihe kpatara ụfọdụ ekwenyeghi, ma ndị nyocha kwuru na ọtụtụ ihe nwere ike ịkpata nkea. Ụfọdụ ịhe ndịa gụnyere obi iju oyi - ọbụrụ na orịa adịkwaghị ebe niile otu ọ dịbụ na mbụ, ọgaghịkwa echu ndị mmadụ ụra ịgba ọgwụmgbochi ọrịa ahụ. Ọgwụ niile, tinyere ọgwụmgbochi, nwekwara nsogbu ndị ọzọ ha na-enye. Mana a na-akpachapụrụ ọgwụmgbochi anya iji hụ na ha rụrụ ọrụ nke ọma ghara imebi ahụike ndị mmadụ. Igwe ịntanet emeela ka ikesa ozi gbasara ọgwụmgbochi dịwanye mfe, mana ọtụtụ akụkọ ndị ahụ anaghị abụcha eziokwu. Na mba Japan, ndị ọkachamara kwuru na akụkọ e kesara nke na-ekwu na ọgwụmgbochi HPV na-ebute ọria ụbụrụisi, mere ka ọtụtụ ndị mmadụ jụ ịgba ọgwụ ahụ. Otu ahụ kwa, na mba Frans, a kọkwara asịrị banyere ọgwụmgbochi ọria influwenza - ndị mmadụ sịrị na arụsighi ọgwụmgbochi ndị ahụ ike tupu gọọmentị agaa zụrụ ha n'ọkụ ọkụ nke mere na ha anakwaghị arụ ọrụ. Na mba UK, akụkọ fesakwara na ọgwụmgbochi MMR na- ebute ọrịa ọtizim. Dr Lindstrand kwuru: ""Otu ihe dị mkpa iji mee ka obi sie ndị mmadụ ike n'ihe gbasara ọgwụmgbochi bụ i nwe ndị ọrụ ahụike a zụrụ nke ọma, ndị dị nkwadebe ịdụ ndị mmadụ ọdụ nke bụ eziokwu, ma nwekwaa ike ịza ajụjụ niile ndị nne na nna nakwa na obodo na-ajụ."" Onye rụpụtara ya Becky Dale na Christine Jeavans; Onye nhazi - Debie Loizou; Onye wulitere ya - Scott Jarvis na Katia Artsenkova" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48689384 +health Etu ịkpụ ụzụ ga-esi mee ka nwaanyị gbasie ike ma maa ezigbo mma - Sandra Okeke Sandra Okeke bụ onye na-akpụ ụzụ ma na-atụzi aka etu e si emegharị ahụ akọwaala ihe mere o jiri banye n'ọrụ ịkpụ ụzụ dịka nwaanyị. Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Okeke sị na ọ bụ ka ahụ gbasie ya ike dịka nwaanyị mere o jiri gbasoo atụmatụ a. Ọ sị na ebumnobi ya na mbụ abụghị ịna-akpụ ụzụ kama na ọ bụ enyi ya nwaanyị dọbatara ya n'ime nke a. Okeke sị na kamgbe afọ 2017 ọ malitere ya na ihe dị iche dị zi n'ahụ ya; na ahụ gbasiri ya ike, makwuo mma. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị ụmụnwoke ka ọ dịịrị ịkpụ ụzụ kama na ụmụnwaanyị kwesịkwara ị na-akpụ ụzụ. “Ụfọdụ ndị mmadụ ma na Naịjirịa nakwa mba ndị ọzọ cheere na ọ bụ naanị ụmụ nwoke ka ọ dịịrị ịkpụ ụzụ mana ọ bụghị eziokwu” ka o kwuru. Ọ sị na mmadụ ịsi ike abụghị ihe ọjọọ kama ha chọọ ịme ya, ha siri n’ụzọ ziri ezi mee ya. Ọ dụrụ ndị mmadụ ndụmọdụ sị ha megharịa ahụ nke ọma ma rie nri zuruoke iji nweta ụdịrị ahụ ha chọrọ. Kirie ihe ndị o kwuru n’uju ebe a. https://www.bbc.com/igbo/articles/cd1gv0pkk8eo +health Coronavirus in Nigeria: Onyeisi NCDC anọrọla na 'quarantine' Akụkọ ndị dị mkpa taa: Onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Chike Ihekweazu anọrọla na 'quarantine'. Ihekweazu gwara BBC na ọ bụ ya ji aka ya wezụga onwe ya n'ọha n'ihi na ya si mba Chaịna lọta n'ọdị nso a. O kwukwara na ihe ya ji wezụga onwe ya bụ iji kee nkwụcha dịka o kwesịrị. Ọ gara n'ihu kwuo na ya ga-anọ n'ime ụlọ abali 14 tupu mmekọ ya na ndị mmadụ amalitekwa. Na mkparịta ụka ahụ, Ihekweazu kwuru na ụlọọrụ ya na-agba mbọ ịhụ etu a ga-esi hibe. Ndị ekperima atọrọla onye ụkọchukwu ụka Katọlik na Benue steeti. Aha ụkọchukwu a bụ David Echioda. Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Punch si kwuo, ọ bụ n'ụbọchị Sọnde ka ya bụ ihe mere. Onyeisi mgbasa ozi ndị Katọlik na Benue bụ ụkọchukwu John Okopupu kwuru na Fada Echioda si n'ebe ọ gara kaa ụka na-alọta oge ndị ekperima ahụ tọọrọ ya. Fada Okopupu kwuru na ndị ahụ akpọbeghị onye ọbụla iji kwuo ihe a ga-eme tupu ha atọpụ Fada Echioda. N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Benue steeti bụ Catherine Anene gwakwara ndị ntaakụkọ na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu. Mana o kweghị ekwu ihe ọbụla ọzọ gbasara ya. Nke a abụghị mbụ nke ọ na-abụ nke abụọ a na-atọrọ ndị ụkọchukwu ụlọụka dị icheiche na Naịjirịa. Ụdị ihe a emeela n'Enugwu, Kaduna, Adamawa. N'ụbọchị Sọnde, abalị mbụ nke ọnwa Maachị, ndị Bishọp ụka katọlịk mere ngagharị ekpere n'Abuja n'ihi ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ na Naịjirịa. Ha tikwara iwu ka ndị Katọlik niile yie akwa ojii n'ụbọchị 'Ash Wenezde'. Ndị ụka ndị ọzọ dị icheiche e mekwaala ngagharị iwe gbasara oke ogbugbu, ntọ na ohi nke dịka ọ na-abawanye na Naịjirịa ugbua. Abụbọọrụ ndị dọkịta n' ụlọọgwụ Esut Teaching Hospital Parklane abaala ụbọchị abụọ ụbọchị Tuzde.Ndị dọkịta ahụ a kpọrọ 'Resident doctors' na bekee kwuru na iwe ha bụ na anaghị akwụ ha ụgwọ ọnwa ziri ezi ya na orubere ja ndị ọzọ nke mere ha jiri bagide abụbọọrụ ịdọ aka na ntị nke ụbọchị ise.Mgbe BBC batara n'ụlọgwụ Parklane, ọtụtụ ndị ahụ na-aya kwara arịrị na ndị dọkịta na else ndị mmadụ ahụ pere mpe n'ihi ya bụ abụbọọrụ.Otu nwaanyi bụ Benedicta Ugwu gwara BBC na ka mgbe ụnyịahụ ka ya bịwara ụlọ ọgwụ mana rule tata ya ahụbeghi dọkinta.Ụfọdụ ebe dị ka Accident and Emergency bụ ebe ndị Resident dọkinta na eju eju bụ nani dọkinta ndị isi old ma old nọ na ya.Onye dọkinta bụ Consultant gwara anyị na ha bụ ndị isi jisiri ike na arụ ya bụ ọrụ sọsọ ha, ma yọọ gọmenti ka otinye anya na ihe ndị out ha na ana ha ka were nwee ikebido ọrụ ọzọ.Permanent Secretary na ministri nke ahụike n'Enugwu adịla na mbụ katọọ abụbọ ọrụ ndị Rrsident dọlinta ahụ.Ministri ahụ kwuru na ha ekwesighị ịgba abụbọ ọrụ ugbua a na-alụ ọgụ Lassa Fever nakwa corona virus tinyekwara na ha gara ya bụ ihe na mberede na agwaghị gọmenti n'oge.Ministry ahụ kwuziri na onye ọbụla nwụrụ na Parklane n'ihi abụbọ ọrụa, na ọbara ya ga-adị ndị Tesident dọkinta n'isi. Ndị ụlọomeiwu nta nke Naịjirịa ekwuola na ha ga-aga ezumike izuụka abụọ. Nke a bụ iji nye ohere ka e tinye ihe ụfọdụ ga-enye aka igbochi mgbasa ọrịa coronavirus n'ogige ha. Ha rịọkwara ka ndị ọ dị n'aka gbasie mbọ ike ịchụpụ ajọ ọrịa na Naịjirịa. Mmadụ 23 ebutela coronavirus n'ụlọomeiwu ndị Iran. Iran nwere ndịomeiwu mmadụ 290, nke a pụtara na otu onye n'ime mmadụ iri n'ụlọomeiwu ahụ bu ya bụ ọrịa. Ewepụ Chaịna, Iran bụ mba nke abụọ ebe coronavirus kacha gbuo mmadu, ma bụrụkwa mba nke atọ kacha nwee ndị bu ọrịa ahụ. Otu egwuregwu bọọlụ Chelsea na Liverpool ga-achịpụ ya n'abalị taa bụ Tuzde iji mata onye ga-agafe n'agba nke ọzọ nke asọmpi FA cup. Otu abụọ a agbaala ọnyụpa n'ọdị nso a. Cheta na Watford zọpịasirị Liverpool ka awarawa tomanto n'ụbọchị Sọnde, ebe Mmanya ngwọ ndị Chelsea agbọghị ụfụfụ na be Bournemouth. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51728536 +health "World Cancer Day 2020: ""Etu m si chọpụta na m nwere Cancer"" - Anwuli Ojogwu" Chi jiri n'ehihie n'anya Anwuli Ojogwu bụ nwaagboghọ chọpụtara na ya nwere akpụ kansa n'afọ 2018. Chi ya gbaara ya ama n'oge maka ọrịa ahụ malitere ito ya n'ara n'afọ ahụ. Nke a mere mgbe Anwuli kụrụ obi ya n'ọnụụzọ ka o si n'ụlọekwu ya na-apụta. Nke ahụ mere ka ọbara sị ya n'ara na-agbapụta. Nke ahụ bụ ụzọ pụrụiche chi ya ji gbaara ya ama n'oge. Nke a mere ka ọ malite ịjụ ese ka ya bụ mmiri si baa opi ụgbọghọrọ. Lezie ihe nkiri a ka ịhụ ka o si mee. Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Chukwudi Okereke, Chiemela Peters Mgbahuru https://www.bbc.com/igbo/afirika-51378911 +entertainment Hajia Sefia Ali nwaanyị awụsa na-ata asụsụ Igbo ka ọjị Hajia Safiya Ali bụ nwaanyị Sokoto birila n'Enugwu ihe karịrị afọ 25 kọwara etu ihe ndị Igbo ji amasị ya nke ukwuu. Ali gwara BBC Igbo na ahụ kpakọrọ ya ọnụ kamgbe ọ malitere ibi n'Enugwu karịa dị mpaghara ugwu bụ ebe o si bịa. Ọ sị na ndị Igbo anaghị enye ya na ụmụ nsogbu chaachaa kama na ha na-enyere ya na ezinaụlọ ya aka. Kirie ihe o kwuru n'uju; Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke, Nnamdi Agbanelo https://www.bbc.com/igbo/afirika-55064380 +politics Senator Abaribe and Orji Uzor Kalu: Gịnị ka ha ji agba onwe ha egbe ọnụ? "Mmadụ abụọ nwere agba n'okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'Abia Steetị bụ Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na Sịnetọ Orji Uzor Kalu na-adụ onwe ha aka n'ọnụ. Esemokwu ha selitere isi elu ka a na-achọ ime ntuliaka onye ga-anọchiteanya mpaghara Aba North/South n'ụlọomeiwu nta dịka Ossy Prestige jibu ọkwa ahụ anwụọla. Mmadụ abụọ gbapụtara ihe n'ịzọ ọkwa ahụ bụ Mascot Uzor nke APC na Chimaobi Ebisike nke PDP na ntuliaka a ga-adị n'ụbọchị Satọde 27 Maachị. Kamgbe achụnta vootu malitere, sịnetọ Abaribe na Kalu na-akwarịta onwe ha egbe ọnụ dịka ha na-achọ ka onye ha na-akwado merie na ntuliaka. N'akwụkwọ Abaribe bipụtara o kpọrọ ""Made in Aba"", o kwuru na ihe mere e ji chutuo ya n'ọkwa osote Kalu mgbe ọ bụ gọvanọ Abia Steetị n'afọ 2003 bụ maka na ọ jụrụ ịgbara mma Kalu egusi. Ọ gara n'ihu kwuo na Kalu agbakebeghi site na mkpọrọ ọ gara n'ihi mpụ, tupu ọ bịa ị chụrụ nwanne ya Mascot Uzor Kalu nta vootu, na ọ maghị na ihe agbanweela n'Abia. Na nzaghachị, Kalu boro Abaribe ọtụtụ ebubo gụnyere na o nweghi ihe ọ rụrụ kamgbe afọ iri na isii ọ nọrọla n'ụlọomeiwu. Ọ gara n'ihu kwuo na Abaribe na-eri ego mgbazinye gọọmentị etiti ji enyere ndị mmadụ aka. Na gọọmentị nyere ego site n'aka ndị Sịnetị atọ na-achịteanya Abia Steetị n'ụlọomeiwu ukwu mana na o nweghi onye ọbụla sinetọ Abaribe nyere ego n'Abia South. BBC Igbo kpọtụrụ ndị Sịnetọ abụọ mana o nweghi onye n'ime ha kwuru okwu banyere ya. Orji Uzor Kalu zara ekwentị ya ma sị na o nweghi ohere ebe Abaribe azaghị ekwentị ya. BBC Igbo ga na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị sịnetọ abụọ, etu eke si anya anwụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-56496969 +business Nigeria's inflation 2021: Etu 'inflation' si akpa mụ na gị eze Na nsonso a, ngalaba ngụkọ Naijiria bụ National Bureau of Statistics(NBS) wepụtara ozi nchọpụta ha mere nke kwuru na ọnụahịa(inflation) e jirila pasent iri na asatọ na ụma(18.17%) rịa elu. Nke a bụ mgbali kachasị kemgbe afọ anọ gara aga. Dịka nchọpụta NBS mere siri kwuo, ihe ndị kachasị tinye ego bụ ngwanri(23%) ọkachasị, anụ,azụ, ji,nduku,bredị,mmanụ akwụkwọnri na mkpụrụosisi. Ọkachamara n'okwu nchọpụta metụtara iji ego achụego jiri osikapa kọwaa ihe ọ pụtara inwe 'inflation' site na ịgbakọ ihe ọ na-eri isi osikapa jelọf ga-ezuru otu ezinaụlọ mmadụ anọ n'afọ 2021 nakwa ihe o riri ime nke a n'afọ anọ gara aga. Ha kwụkwara ihe e nwere ike ime iji gboo ya bụ ọgụ mgbalielu ọnụahịa. Lee ya n'uju n'elu: https://www.bbc.com/igbo/afirika-56848279 +health Women Health: Ọrịa isii kacha emetụta ụmụnwaanyị karịa ụmụnwoke "Etu nnukwu ndịiche si dị n'etiti nnukwu 'B' na ọkpa ehi zọrọ n'ala, otu a kwa ka nnukwu ndịiche si dị n'ahụ nwaanyị na nke nwoke. Sayensị emeela na nwoke nwereike ịgbanwe onwe ya bụrụ nwaanyị, maọbụ nwaanyị agbanwee onwe ya bụrụ nwoke, mana ụbọchị awọ ga-amaba mmiri ọkụ, ka ọ ga-achọpụta na mmiri dị ụzọ abụọ. N'ihi etu ahụ ha si dị, e nwere ọrịa bụ naanị ụmụnwaanyị na-arịa ya. E nwekwara ụdịrị ọrịa na-aka apụta ihe n'ahụ ụmụnwaanyị karịa ahụ ụmụnwoke. Ọ bụ ụfọdụ ọrịa dị etu a ka anyị chọrọ itule n'akụkọ a. 1. Osteoarthritis (Agba Ikpere) Ọrịa ọbụla na-emetụta njikọ ọkpụkpụ mmadụ ka a na-akpọ ""arthritis"". Mana nke a bụ Osteoarthritis na-akacha emetụta ụmụnwaanyị karịa ụmụ nwoke. Enyochapụtabeghị ihe kpatara nke a. Ọrịa Osteoarthritis na-emetụta ọkpụkpụ azụ (spine), ọkpụkpụ ukwu (hip), ikpere, nakwa njibi ụkwụ (ankle). Ihe na-akpata Osteoarthritis bụ mgbe ihe na-ejikọ ọkpụkpụ bụ 'cartilage' kwọchara, nke ga-eme ka ọkpụkpụ abụọ na-echikọta ọnụ. Oke ibu, nka nakwa ọrịa ọkpụkpụ bụ ihe ndị nwere ike ịkpata ọrịa a. 2. Lupus ""Lupus"" bụ otu n'ime ọrịa nke bekee kpọrọ ""autoimmune diseases"". E nwere ihe ndị dị n'ime ahụ mmadụ nke na-enye aka iji gbochie ọrịa, mana mgbe ụfọdụ, ihe ndị ahụ na-egbochi ọrịa nwekwara ike tụgharịa malite ibuso ahụ mmadụ agha. Ọ bụ mgbe ihe dị otu a mere ka a na-ekwu na mmadụ nwere 'autoimmune disease. Otu ọgwụ nke ndị ọkachamara kwuru na ọ na-enye aka maka ọrịa 'Lupus' bụ nke a kpọrọ 'hydroxychloroquine'. 3. Goiter Goiter bụ ọrịa na-eme ka akpịrị mmadu zaa azaa. Ihe na-akpata ya bụ mgbe akụkụ ahụ a kpọrọ 'Thyroid' anaghị arụcha ọrụ nke ọma. 'Thyroid' bụ obere akụkụ ahụ mmadụ a na-ahụ na mgbadata eko akpịrị (adam's apple). Ọ na-ewepụta 'hormone' dị icheiche nke abụọ n'ime ha bụ 'thyroxine' na 'triiodothyronine'. Ọ bụrụ na 'hormones' ndị a apụtaghị etu o kwesịrị, ọ ga-eme ka 'Thyroid' malite ibu ibu. Nke a ka a na-akpọ 'goiter'. Oge ụfọdụ kwa, ihe na-akpata 'goiter' bụ mgbe 'iodine' kọrọ mmadụ n'ahụ. Ọrịa 'goiter' ka emetụta ụmụnwaanyị ọkachasị ndị gbarala afọ 40 maọbụ karịa. 4. Dayabitis ụdị nke mbụ (Type one diabetes) Dịka onye ọbụla ma, dayabitis bụ ọrịa nke na-eme ka shuga karịa n'ọbara mmadụ. Ahụ mmadụ na-emepụta ihe a kpọrọ 'insulin' nke na-enye aka ịgbari shuga dị mmadụ n'ahụ. Ọ bụrụ na ahụ mmadụ enweghị ike imepụta 'insulin', ọ bụ ya na-akpata dayabitis ụdị nke mbụ maọbụ 'type one diabetes' na bekee. Ụdị dayabitis a na-eme ma ụmụnwoke ma ụmụnwaanyị, mana nnyocha gosiri na ọ ka egbu ụmụnwaanyị karịa ụmụnwoke. 5. Ọrịa akpụ ara (Breast Cancer) Ọnụọgụgụ ndị nwere ọrịa 'breast cancer' n'ụwa niile karịrị n'ụmụnwaanyị karịa ụmụnwoke. N'ime ndị niile nwere ọrịa a, naanị otu pasentị bụ ụmụnwoke. Amachabeghị kpọmkwem ihe na-akpata ọrịa 'breast cancer' mana ihe ndị ọkachamara chọpụtara bụ: 6. Cervical Cancer Ihe na-akpata ọrịa 'cervical cancer' bụ nje a kpọrọ 'human papillomavirus' maọbụ HPV n'aha ịchafụ. Ọ bụ ụmụnwaanyị ka ọrịa a kacha eme, mana nje HPV nwere ike ịkpata ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ n'ahụ nwoke. Ha gunyere kansa amụ nakwa kansa ike (penile cancer, anal cancer)." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52756892 +business 2020 Budget: Etu o kwụ n'ihu nke 2019 nakwa etu ọ ga-esi metuta akụnaụba Naịjirịa "Dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari tinyere akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2020 n'iwu, otutu ihe dị iche ebutela nrụrịtaụka banyere ya. Okwu a kpụ n'ọnu bụ ihe gbasara ihe ndị dịka Agụmakwụkwo, nchekwa, ahụike, ịko ubi na ihe ndị ọzọ. Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe banyere akụnaụba bụ Davoe Okorie kọwara BBC ụfọdu ihe maka Bọjetị 2020. Okorie kọwara na ọ bụru na ego gọomentị wepụtara maka agụmaakwụkwọ, ahụike, nchekwa na ọrụ ugbo dị obere karịa nke afọ 2019, kedụ zie ihe mere Bọjetị 2020 ji karịa nke 2019? Ọ kọwara na ọ bụ ụgwọ gọọmentị Naịjirịa chọrọ ikwughachi mere ka ego 2020 ji karịa nke 2019. Okorie gosikwara na Gọọmentị tụrụ anya na ha ga-akpata ego ga-eru puku nde naịra asatọ dịka ha dere na Bọjetị 2018 kama ọ bụ naanị puku ijeri naịra abụọ ka gọọmentị Naịjirịa kpatara. Ọ gara n'ihu kọwaa na gọọmentị na-ebite ego iji kwụọ ụgwọ ọnwa na ihe ndị ọzo na-agaghị amịta mkpụrụ a ga-eji kwụghachị ụgwọ. Ihe ọzọ o kwukwara bụ na ụgwọ ""subsidy"" gọọmentị na-akwụ na-anapụ ndị Naịjirịa ohere iji nweta ihe dị iche iche ga-eme ka ndụ dị ha mfe. Maazị Okorie sị na gọọmentị ga-eme ụfọdụ ihe ndị a iji mee ka ihe dị mma. Na nchịkọta, Okorie sị na gọọmentị jisie ike tinye ego na akụnaụba Naịjirịa nke ga-eme ka ọrụ dị mma, were nwaayọ na-emefu ego ka Naịjịrịa nwee ike ikwụ ụgwọ ha ji." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50835637 +politics Burundi President: E liela Pierre Nkurunziza bụbu onyeisiala mba Burundi Taa bụ Fraide ka e liri Pierre Nkurunziza bụbu onyeisiala mba Burundi n'obodo Gitega. Nkurunziza chịrị mba Burundi afọ iri na ise tupu ọ nwụọ site n'ọrịa 'mgbachi obi' izuụka abụọ gara aga, dịka gọọmenti mba ahụ siri kwuo. A na-ebo Nkurunziza ebubo ọchịchị nchigbu mana ọrụụ ọrụ pụụ iche n'ahụike dịka o hiwere atụmatụ ụmụnwaanyị dị ime na ụmụaka erubeghị afọ ise ịnata nleta n'ụlọọgwụ n'efu. Mana ọ gbara ọnyụpa n'ọgụ megide coronavirus dịka ọchịchị ya ejighị obi dimkpa lụọ ọgụ ahụ. Mba Burundi ewepụtala ụbọchị asaa iji ruo uju maka onyeisiala ha bụ Pierre Nkurunziza. Mana ndị ọchịchị obodo ahụ na-ekwusi ike na ọbụghị ọrịa coronavirus gburu ya, ma dọkwaa aka na ntị ka ndị mmadụ zeere asịrị dị otu a. Nke ka njọ ugbua bụ na ọnwụ Nkurunzịza etinyela Burundi n'ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme. Nwunye ya bụ Denise Nkurunziza butere ọrịa coronavirus. Akụkọ na-ekwu na ọ gara mba Kenya ga nweta ọgwụgwụ ma mechaa lọghachi. Akụkọ na-ekwukwa na onyeisi ụlọ omeiwu Burundi bụ Pascal Nyabenda na-arịakwa ọrịa Covid-19. Dịka iwu Burundi sị dị, ọ bụ Nyabenda kwesịrị ịnọchi onyeisiala ma a chọọ ya achọọ. Evariste Ndayishimiye, bụ onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala nke e mere na Burundi n'ọnwa gara aga, nwekwara ọrịa coronavirus, dịka akụkọ ụfọdụ si kwuo. Mana odochaghị BBC anya ma ya bụ akụkọ ọ bụ eziokwu. Gọọmenti mba Burundi kwupụtara ọnwụ onyeisiala ha bụ Pierre Nkurunziza n'ụlọọgwụ dị na Burundi n'ụbọchị Mọnde. Ha kwuru na Nkurunziza onye gbara afọ 55 gbabiri nwụọ site n'ọrịa njide obi (cardiac arrest) dịka ebugachara ya n'ụlọọgwụ Karusi nke dị nso n'ụlọ ya n'ụbọchị Satọde. Kepukepu kwuburu na nwunye Nkurunziza buteburu ọrịa coronavirus, akụkọ Nkurunziza ekweghị ka ntị nụ, kama haziri ntuliaka ka ọrịa ntuliaka dịka ọrịa dịka ọ chụpụrụ ndị ọrụ WHO n'ala ha. Dịka gọọmenti mba ahụ si kwuo, a ga-eme emume ọkwụkwa ya abalị asaa bido taa bụ Tuzde. Nkurunziza bidoro ịchị Burundi kemgbe afọ 2005 na-achọbu inyefe ọchịchị n'aka onye meriri na ntuliaka e mere bụ Evariste NDayishimiye n'ọnwa Ọgọstụ, afọ 2020. 6. Ngagharịiwe so mbọ ọ gbara iji banye ọchịchị agba nke atọ ya n'afọ 2015 tara isi puku kwuru puku ndị mba Burundi. 7. Ọtụtụ gụnyere 'Human Rights Watch' katọrọ ya maka mmegide ikike dịrị onye dịka inwụchi ndị mmadụ aghara aghara, ogbugbu ndị mmadụ na-agbasoghi iwu,iti ihe na mkpagbu ndị ọzọ. 8. Ọ tụrụ ụfọdụ ndị ntaakụkọ mkpọrọ. 9. Nkurunziza, 'onye chegharịrị e chegharị' lụrụ nwaanyị aha ya bụ Denise, onye ya na ya ji ụmụ ise. 10. Ọ gara erite nnukwu ụlọ na ego dị ijeri dọla $540,000 oge gara aritu n'ọnwa Ọgọstụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52985198 +politics Anambra Governorship Election countdown: Ndị mmadụ sị Anambra apụ n'ihi egwu ọgbaaghara ntuliaka Ọka bụ isi obodo Anambara steeti na-ekwo n'abalị abụọ nke ọnwa Novemba ihintuliaka onye ga-abụ Gọvanọ adịla nso. Ndị Anambara ga-ebinye aka n'akwụkwọ onye ga-achị ha n'ụbọchị Satọde abalị isii nke ọnwa Novemba afọ 2021. Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ọdụ ụgbọala njem dị iche iche n'Ọka were hụ na ọtụtụ mmadụ sị Anambara na-apụ apụ n'ihi egwu ọgbaghara nwere ike ịdapụta ụbọchị ntuliaka ahụ. Na Uni Zik Junction , otu nwoke na-eme njem aha ya bụ Geofrey Ugah kwuru na ya na-eme njem ahụ makana ha achọghị ị nọ n'Anambra site na 4th Nov ruo izu ụka n'abịa abịa. Out onye ntorobịa anyị kwudoro ebe a na adọrọ ego bụ ATM kwuru na ya bịara iwere ego ugbua makana egwu dị na ngwa ngwa elekshiọn na atinye ụkwụ, ego nwere ike ịkọ ụkọ na Bankị. Ntuliaka onye ga-achị Anambra ga afịọ ụbọchị satọde na-abịanụ. Cheta na otu na-azọ nwere onwe bụ IPOB ekwuola ka onye ọbụla ghara ịpụta ezị site na 5th rue 10th nke ọnwa November. Mana gọmenti ekwuola na ya bụ ntuliaka ga-adịrịrị ụbọch Satọdee. Unizik ga-emechi malite 4-9 ọnwa Novemba Ka nke a na-eme, Mahadum Nnamdi Azikiwe University dị n'Ọka, Ekwuola na ha agaghị enwe agụmagwụkwọ malite n'abalị anọ rue abalị Itoolu nke nke ọnwa Novemba. Nke a pụtara n'ihe n'akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwurmahadum ahụ bụ Chika Gladys Ene ahụ binyere aka ma werpụta ụbọchị Tuzde, abalị abụọ nke ọnwa Novemba. Mana ozi ahụ ekwughị ihe kpartara mechi nkuzi ahụ ha gbara ọkwa ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-59136414 +health Water Pollution: A chọpụtala ebe ihe gbarụrụ mmiri Nvuna Nomeh si pụta Gọmenti Enugwu Steeti emechiela ngalaba ụlọọrụ D-Hap Integrated services limited dị n'Ituku bụ eche na ihe gbarụrụ mmiri Nvuna Nomeh si pụta. Kọmishịọna na-ahụ maka gburugburu obibi bụ Chijioke Edoga gwara BBC na ndị ọrụ ya nụrụ mkpu akwa ndị obodo were gaa chọpụta na ihe gbarụrụ mmiri ahụ si n'ụlọọrụ na-emepụta 'ethanol'. Edeoga sị na gọọmenti Enugwu agbachiela ngalaba ụlọọrụ ahụ na-emepụta ethanol ruo mgbe a ga-emecha nchọpụta. O kwukwara na ha ewerela akụrụngwa si n'ụlọọrụ ahụ gawa mahadu UNN ime nyocha iji mata kpọmkwem ihe gbụrụ mmiri a. Igwe ndị Nomeh bụ Igwe Israel Mba gwara BBC na kamgbe mmiri a gbarụrụ n'ụbọchị 16 Maachị na ndị Nomeh enweghị mmiri ọṅụṅụ maọbụ nke e ji eme ihe ọzọ. Igwe Mba rịọrọ gọọmenti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka. BBC Igbo chọpụtara na mmiri ahụ a chapụla karịa ka ọ dị n'izuụka gara aga mgbe ihe a gbụrụ ya. Kirie ihe ndị anyị chọpụtara n'uju; https://www.bbc.com/igbo/afirika-56496971 +entertainment Adịghị m ime, nke m na-akwado ịlụ Lucky Oparah - Eucharia Anunobi "Onye ihe ejije a ma ama bụ Eucharia Anunobi akatọọla kepukepu fegharịrị na nso nso a nke kwuru na ọ na-akwado ịlụ nwaokorobia o ji afọ 20 tọọ. Akụkọ fegharịrị na soshal midia na nsonso a boro ebubo na Anunobi ha sị gbara afọ 57 na-ayị, ma na-akwado ịlụ Lucky Ọparah gbara afọ 27 bụ onye na-etolite etolite n'ihe ejije Nollywood. Ụfọdụ akụkọ ahụ fegharịrị boro ebubo na Opara atụnyelarịị Anunobi ime. Mana n'ihe onyonyo o wepụtara na nsonso a n'akara Youtube ya, Eucharia Anunobi kwuru na akụkọ ndị a niile bụ ""nkonukọ na okpotokpo asị si ọkụ ala mmụọ"". O kwuru n'ezie na ya ma Lucky Oparah bụ onye ya na ya zutere n'ihu ọrụ ime ejije bụ ebe o mere agwa nne ya. O kwuru na aka ọrụ ya tụrụ nwaokorobịa ahụ n'anya nke mere ka ọ bịa rịọ ya ga ya na-agbaziri ya ụzọ. O kwuru na dịka ndị mmadụ na-eme dịka ha hụ onye ezinaụlọ ha maọbụ onye nwere agba, ha na ya ese foto na onyonyo, tinye n'aka ọbaozi ha, na Oparah ji ekwentị ya see foto na ihe onyonyo o tinyere n' ọba ozi ya nke ndị ọ kpọrọ ""ndị obi ọjọọ"" were gaa na-ekesa akụkọ ụgha banyere ha. Ọ sịrị: ""Achọrọ m ịgwa ndị ezinaụlọ m nile, ndị hụrụ n'anya, ndị enyi ,ndị na-eso m, ndị isiụka na ndị ụkọchụkwụ, na akụkọ ndị a nile bụ nkonukọ na okpotokpo asị si ọkụ ala mmụọ"". "" Achọrọ m iji ohere kwuo gbowam na mụ na Lucky Oparah anaghị ayị ,nke a enwe agbam akwụkwọ ọbụla a na-akwado."" ""Ọ bụ mkparị nye ọkpụkpọ Chukwu kpọrọ m ndị ọbi ọjọọ a sị na m dị ime na-alubeghị di dịka onye bụ 'apọstle.'"" ""Onye ọbụla ma m ma makara maka ọrụ dịka onye ụkọchukwu ma na m na-ekwugide ụd̄ị ihe a."" Anunobi kwuru na ndị fesara akụkọ ahụ ghakwara ụgha banyere afọ ole ya dị dịka ha sị na ọ dị agbata afọ 56 na 57, ma kwuo na ekpere ya bụ na ya ga-adị ndụ rue afọ ole ndị a nile ha sị ya dị. O kwuru na ndị kwuru na ya adịla ime na alụbeghị kpụrụ ọkpụkpọ Chineke kpọọ ya dịka ụkọchukwu n'ala dịka ya na-ekwugide ndụ luru inyi mgbe ọbụla. "" Ọ bụkwa ihe ịkpa ọchị na ndị a obi ha gbagọrọ agbagọ nyere m afọ ole abụghị nke m."" ""Ụfọdụ sị na adị m afọ 56, ụfọdụ sị na m dị 57."" ""Ikekwe, ụfọdụ ga-apụta sị na m dị afọ 120."" ""N'ezie, ama m Lucky Oparah, Ọ bụ onye m na-agbaziri ụzọ(mentee)."" "" Mụ na ya zutere na-ebe anyị na-eme ihe ejije."" ""Etu m si eme ihe ejije tụrụ ya n'anya nke mere ka ọ bịa rịọ m ka m na-agbaziri ya ụzọ."" Ọ gara n'ihu kọwaa na dịka ndị mmadụ na-ese foto maọbụ onyonyo ndị ezinaụlọ ha, ndị enyi, ndị ama ama, na ""Lucky sere foto na ihe onyonyo mụ na ya oge anyị nọ n'ihu ọrụ tinye ya n'aka ọbaozi ya, ọ bụ ya ka ndị iro, ndị iro nwe ha gbakọtara tinye dịka ihe gosiri akụkọ ụgha ha"" Ọ gara n'ihu boo ""ndị kpọrọ ya asị"" ebubo idepụta ma kesaa akụkọ ụgha ahụ sị na kama imegide ya, na o mere ka aha ya dawa ụda karịa ka ọ dị na mbụ na Naijiria nakwa ụwa nile dịka ọtụtụ ndị mmadụ na otu nwere agba na-akpọ ya n'ekwentị ịmata nke bu eziokwu." https://www.bbc.com/igbo/articles/cw05rppkjvro +sports Akụkọ kachasị n'abalị a: Serena Williams agaghị asọmpi Italian Open Akụkọ kachasị n'abalị a Naịjirịa akwadola maka Ebola Ndị ọrụ Immigration na ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) na-ekwu na ha ekeela nkwụcha iji hụ na ọrịa ebola bịachịrị na mba Congo abataghị Naịjirịa ọzọ. Ha kwuru na ha na ndị ọrụ nchekwa na Congo na-akpakọrịta. A chụọla kọmishọna uweojii n'Imo steeti Ewepụla onye bụbu kọmishọna ndị uweojii nke Imo steeti bụ Chris Ezike. Akụkọ kwuru na-ewepụrụ ya n'ọrụ maka ọnọdụ ya n'ihe mere n'etiti ndị ọnụ na-eru n'okwu n'otu APC na Rochas Okorocha bụ gọvanọ Imo steeti. N'akụkọ mba ofesi, Ndị mba North Korea atọghapụla ndị mba Amerịka atọ ha tinyere n'ụlọ mkpọrọ. A na-ahụta ya ka ihuọma ndị North Korea chọrọ iji kwado maka nzukọ dị n'etiti onyeisiala ha bụ Kim Jong-un na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump. Serena Williams agaghị asọmpi Italian Open Serena Williams bụ dike n'ịpịa tenis ekwuola na ọ gaghị eso asọmpi Italian Open maka na ọ ka chọrọ ohere ikwado ọfụma maka asọmpi nke mbụ ọ ga-apịa na clay kamgbe ọ mụchara nwa. Ebe Wilfried Zaha bụ onye egwu ndị otu Crystal Palace enwetala ihe nrite 'ọkacha agba na Premier League' nke ọnwa Epreelụ. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji ebe a Lee ihe nkịrị taa https://www.bbc.com/igbo/afirika-44059942 +entertainment Oscars ewepụla 'ejije Naịjirịa' ọzọ na nturuugo ha "Ndị na-ahazị emume nturuugo ejije a kpọrọ Oscars akụpụla ihe nkiri a kpọrọ 'Joy' makana a sụrụ ọtụtụ Bekee n'ime ya. N'agbanyeghi na Joy bụ ejiji e mere na mba Austria, mana ọ bụ ndị Naịjirịa mere ya dịka ọ bụ maka ụmụafọ Naịjirịa na-agba akwụna na Yurope. Joy pụtara na mbụ n'emume ihe nkiri a kpọrọ Venice Film Festival n'ọnwa Sepụtemba 2018. Ọ pụtara nke ọma n'Austria n'ọnwa Janụwarị nke afọ 2019. Jennifer Davidson bụ onye mgbasaozi na ngalaba a kpọrọ ""Academy of Motion Picture Arts and Sciences"" - bụ ndị na-ehiwe Oscars - gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na e wepụrụ ejije a. Ọ sị, ""Dịka anyị na-eme n'afọ niile, anyi nọ n'ime enyocha ejije ndị e tinyere n'ogogo ""International Feature Film"" iji mata ma ha sonyere n'iwu anyị. ""Ejije ""Joy"", bụ nke mba Austria wetere, dara nyocha makana ọ bụ soso asụsụ pasentị iri atọ na atọ (33%) bụ ihe na-abụghị Bekee n'ime ya."" Na nke nke, nd��� na-ahazi Oscars sị na ha wepụrụ ejiji a n'okwe maka Bekee karịrị n'ime ya. Nke a na-abịa dịka ndị nhazi Oscars wepụrụ 'LionHeart' maka ọtụtụ Bekee a sụrụ n'ime ya. Ogogo nturuugo a họpụtara ihe nkiri abụọ ndị a (Joy na Lionheart) bụ nke a kpọrọ ""Best International Feature"". Ogogo a bụ maka ihe nkiri e ji asụsụ na-abụghị Bekee mee." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50381568 +politics Rochas Okorocha: 'Ipob biko kọwara anyị ebe ụnụ kwụ ka anyị sonyere ụnụ' "Gọvanọ chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ bụrụ na ndị Igbo ga-enwe ọche onyeisiala n'afọ 2023, ọ ga-doriri ndị ugwu anya. Ọ rịọrọ ka ndị ntaakụkọ kwụsị ịkpọ ya oche onyeisala ndị Igbo makana o nweghị agbụrụ ọbụla edowere ya iche. Okorocha kwuru nke a mgbe ọ na-asa ajụjụ ọnụ ndị ntakụkọ ụlọọrụ mgbasaozi 'SUN' gbara ya nso nso a. Okorocha jụkwara kedụ uru Ipob ga-erite maọbụrụ na ndị Igbo kewapụ onwe ha na Naịjirịa. N'okwu ya, ""ọ bụrụ na ndị isi Ipob azanwụghị ajụjụ a, ọ ga-ahịara ndị isi otu ahụ ịchịkọta ebumnobi ha."" O kwuru na ruo ugbua ọ mabeghị ebe Ipob kwụ akwụ. Gbasara okwu na-ese n'etiti ya na gọọmenti Imo steeti ugbua, Okorocha kwuru na ihe gọọmenti Ihedioha na-eme e doghi ha anya. O kwuru na ebe a na-ata ya ụta bụ na ọ naghị eke ego. Gbasara ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu, Okorocha kwuru na o nwere olileanya na ọ ka ga-achị Imo steeti. Okorocha kwuru na nyocha EFCC na-eme ya adịghị njọ makana ha nyocha, o nweghị ihe ha fụrụ, ha hapụkwa onye ahụ. Mana ọ na-rịọ ka ndị mmadụ kwụsị ịhụ ndị a na-eme nyocha dịka ekperima. Okorocha kwuru na okwu na ya napụrụ ndị mmadụ ala n'ike ha n'Imo bụ okpotokpo asị." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49705853 +entertainment Davido ọ kụọla aka n'ụzọ ọyị ya nwaanyị o bunyere ụgbọala naira 45 million? "Ụmụ Naịjirịa etinyela ọnụ gbasara akụkọ na Davido na-akwado ilụ Chioma Rowland, ọyị ya nwaanyị. Nke a na-eme ka Davido wepụtachara foto gosiri mgbe ya ndị be Chioma nọ n'elu Instagram wee dee ""First of all introduction"". Nwanne Davido bụ Adewale Adeleke tinyekwara ọnụ n'okwu a. Ndị ọyị ya ndị ọzọ nakwa ndị nso nso ya kwuru ọtụtụ ihe maka ya bụ ndepụta. Etu ọ dị ugbua, amabeghị mgbe ya bụ alụm dị na nwunye ga-eme mana etu Davido depụtara maka ịkụ aka n'ụzọ o mere na-eme ka ndị mmadụ na-akwado maka igba nkwụ ha. Ha bakwara ya aha dịka #CHIVIDO2020." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49562057 +health Coronavirus: Ihe dị mkpa gọọmentị Naịjirịa na-eme ịgbochi ọrịa a "Coronavirus bụ ọrịa ọhụrụ si na akụkụ Wuhan na mba Chaịna pụta egbuola mmadụ 170. Ka ọ dị ugbua, ọrịa ahụ eferela rue mba iri na isii ma jide kwa mmadụ 7711 na mba ụwa niile. E chere na o rutela mba Afrịka mana nwata akwụkwọ e chere na ọ nwere ya na mba Ivory Coast enweghi ya. Naịjirịa bụ ebe ọtụtụ ndị mba Chaịna na-abịa a zụ ahịa ya mere anyị ji jụọ ""Gịnị ka gọọmentị Naịjirịa na-eme ijji gbochi ọrịa a"" Minista na-ahụ maka ahụike bụ Osagie Enahire agwaala ndị Naịjirịa ha kwụsịtụ njem mba Chaịna ugbua N'ọnụ ya ""ọ dịla mkpa ịgwa ndị Naịjirịa ha hapụ ị ga Chaịna sọsọ maọbụ okwu dị oke mkpa"". Ihe ọzọ Enahire kwuru bụ na ebidola nyocha pụrụiche n'ọdọụgboelu ofesi niile dị na Naịjirịa. Ha gụnyere Abuja, Kano, Porthacourt, Enugu nakwa nke dị na Legọs. Ha kwuru na ha ahaziela ogige ebe ha ga-edobe ndị a chọpụtara na ha bu ọrịa ahụ maka nyocha. Njikọ aka maka ọdịnma ahụike ndị mmadụ Ngalaba na-enyocha ọrịa na-efe efe bụ NCDC n'aha ịchafụ ekwuola na ha na WHO ejikọla aka maka ịluso ọrịa ọgụ. Cheta na WHO ekwubuola na ọrịa nwereike ifesa mbaụwa niile nke ha kpọrọ ""Epidemic outbreak"" na Bekee. Ebe Onyeisi Nigeria Diasposara Commision bụ Abike Dabiri kwukwara na onweghi onye Naịjirịa buterela ọrịa a na Chaịna. O kwukwara na ụfọdụ ụmụakwụkwọ agaala n'ụlọọrụ Naịjirịa dị na Chaịna. ""Anyị na Ministri na-ahụ maka ndị ofesi ejikọọla aka ịma etu anyị ga-esi kpọpụta ndị tọrọ ebe ahụ"" ka o kwuru. Mana, otu nwata akwụkwo ya na BBC Igbo kpara nkata sị na onwebeghị onye ha hụrụ ma kwuo na ọ bụ agụ bụ isiokwu ha ugbua. ""Ndị Gana izitaala ha ego mgbachi akpa, mana anya anyị ahụbeghị ndi nke anyị."" Ọ gwakara n'ihu dụọ ndị Naịjirịa na-abịa Chaịna ọdụ maka nke a ma sị ka ha ghara ịbịa Chaịna ruo oge nje a lala." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51307393 +sports Super Falcons: Naịjirịa nọzi na kwara pụ kwara pụ Otu Jamini ji ọkpụ goolu atọ gbanye ndị Super Falcons Naịjirịa ọgbaghara n'isi mgbe ha zutere onwe ha taa. Ọ bụ na nkeji iri na itoolu ka Alexandra Popp onye ndu ụmụnwanyi Jamani jiri otu goolu were mepee akwụkwọ na asọmpi a. Ka nkeji asatọ gachara ka enyere Jamanị Penaltị mgbe ogbuopị jiri igwe VAR were huta na ọ bu penalty n'ezie. Na nkeji 26 ọzọ Sara Dabritz nke Jamini gbara penaltị ahu were ziga onye nche boolu Naịjirịa bụ Chiamaka Nnaedozie gawa Aba kama boolu gawara Owerri. Dịka ndị super Falcons mere ka ha etetela n'ura, Lea Scụller nke Jamanị were kwa goolụ ọzọ na nkeji 81 were chụpụ ha kpam kpam. Na agbanyeghị mmeri a, ndị Super Falcons gbaliri ike ha ma gosị kwa ndị Naijirịa na olileanya dị maka asọmpi iko mba ụwa nke 2023. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48733303 +health World Aids Day 2019: Nri ndị ga-edozi onye nwere nje HIV ahụ Na mmadụ na-arịa ọrịa HIV abụghị na a maala onye ahụ ikpe ọnwụ dịka ụfọdụ ndị na-eche na ụwa agwụla. Ihe dịrị onye ahụ ime bụ ịṅụ ọgwụ dịka dọkịta si tụzie aka ma rie ezigbo nri dịka o kwesịrị. N'emume iji cheta ụbọchị ọrịa HIV nke afọ 2019 a, BBC Igbo kpọtụrụ onye ọkachamara n'ihe banyere nri bụ Amaka Ezeoke ka ọ kụziere ndị mmadụ nri ndị ha kwesịrị ị na-eri. Ezeoke onye nwe ụlọọrụ 'Nutrifit Wellness and Consult' sị na o nweghi nri pụrụiche ha kwesịrị iri kama na ọ bụ iri ezigbo nri na mgbe o kwesịrị. Ọ gara n'ihu sị na ụdị nri dịka ndị a ga-enyere onye ahụ aka; Mkpụrụosisi Ọ sị na onye nwere ọrịa HIV kwesịrị ị na-aracha mkpụrụosisi nke ọma nakwa n'oge niile, na ọ na-enye aka ibulite vitamin na mineral dị n'ahụ onye ahụ iji buso nje ahụ agha. Mkpụrụosisi ndị dịka oroma, ọkwụrụ Bekee, apụl, unere, ube, anyụ Bekee dgz, ndị dị mma na-abụghị ndị rere ere. Akwụkwọ nri O kwesịrị iri akwụkwọ nri nke ọma na-abụghị nke rere ere maọbụ nke e sigwọrọ esigwọ. Nke na-enyekwa vitamin na mineral n'ahụ. Akwụkwọ nri ndị a gụnyere ụgụ, tomanto, ọha, onugbu, kukumba na ndị ọzọ. Nrị ndị e siri n'ọkụ Onye ahụ ga na-eri nri ndị e siri n'ọkụ nke ọma na-abụghị mgbe niile ọ na-eri nri eghere eghe. Nri ndị a gụnyere osikapa, ji, akwa, nduku, ofe na garrị, akwa, mmiri ara ehi dgz. Ọ gara n'ihu kwuo na onye ahụ kwesịrị ị na-eri nri e siri n'ụlọ ya na-agụkarịghị nke e siri n'ezi ọ zụrụ azụ. Nke ọzọ bụ na ọ ga-asapụ aka ya ọcha tupu ọ na-eri nri ọbụla ọ chọrọ iri. Ịṅụ ezigbo mmiri Dịka ahụ onye ọbụla chọrọ mmiri, etu a ka ahụ onye nwere ọrịa HIV chọkwara mmiri. Nke a pụtara na onye ahụ agaghị eji ịṅụ mmiri egwu egwu, o nwereike ịṅụkwa ihe ndị ọzọ nwere mmiri dịka mmiri a pịpụtara na mkpụrụosisi nke Bekee kpọrọ 'juice'. Gbaara nri nwere oke nnu na ọtọbịrịbịrị (Sugar) ọsọ Ọ sị na onye nwere ọrịa HIV ekwesịghị iri nri nwere oke nnu na ọtọbịrịbịrị makana ọ na-egbu mkpụrụobi onye ahụ. Belata oke abụba na mmanụ N'agbanyeghi na abụba na-enye ike n'ahụ, ọ bụghị ya mere ka onye na-arịa ọrị HIV ga-eji rie ya nke ukwuu. O kwesịrị ibelata etu o si eri ya maka ọrịa mkpụrụobi. Ezeoke gara n'ihu nye ndị nwere ọrịa HIV ndụmọdụ ka ha na-emegharị ahụ kwa mgbe kwa mgbe, makana ọ na-enye aka imezi ahụ. Ọ sị na nke kachasị mkpa bụ ka onye ahụ ṅụọ ọgwụ ya dịka o kwesịrị, rie ezigbo nri dosa aka ya na onwe ya ọcha ma megharịa ahụ nke ọma. Na onye ọbụla na-agbaso usoro a ga-enwe ezi ahụike nke na-agaghị egosi na o nwere ọrịa HIV. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50597418 +religion End Sars: Ihe Fada Mbaka gwara ndị kwuru na ha ga-agba 'Adoration Ministry' ọkụ Ụkọchukwu ama ama bụ Fada Ejike Mbaka ekwuola na o nweghi onye kachasị akwado ndị ntoroọbịa na Naịjirịa karịa ya Mbaka kwuru nke a mgbe ọ na-akatọ akụkọ pụtara na soshal midia na ndị omekome gbara ụlọ ekpere 'adoration' nọ n'Umuchigbo ọkụ n'ihi ngagharịiwe Endsars. Ọ dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ị na-ekwuto aha ya na soshal midia ma na-atụ asị emegide ya. O kwuru na onweghi enyemaka ọbụla 'adoration ministry' nweterela n'aka Onyeisiala Buhari kamgbe ọ bara ọchịchị. O kwuru na o nweghị 'oil block' ọbụla Onyeisiala Buhari nyere ya nke o ji enwe onye ewere n'ọrụ n'aha ya. Nlegharị anya BBC Igbo legharịrị n'ogige ekpere a gosikwara na ọ bụ eziokwu na o nweghị ọkụ ọbụla a gbara n'adoration' Enugwu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-54706283 +business Teacher's Day 2020: Nwoke na-azụ ụmụaka 1000 n'akwụkwọ n'efu n'Aba Nwa Aba aha ya bụ Akachi Nwoke egosila na Aba na-eme ọgọ site n'ịzụ ụmụakwụkwọ ruru otu puku n'efu. O kwuru na ihe kpalitere mmụọ ya ime ya bụ ihe bụ na ọ chọrọ ibelata agwa ọjọ dị n'etiti ndị ntoroọbịa. O kwukwara na ọtụtụ ụmụakwụkwọ ọ na-azụ bụ nwa enwe nne na nwa enwe nna. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Ikechukwu Kalu https://www.bbc.com/igbo/afirika-50298984 +entertainment Ibidunni Ighodalo: Lee etu akwamozu ya si aga ugbua "Ka otu izu ọ nwụrụ gachara, ezinaụlọ Ibidunni Ighodalo agbakọọla maka akwamozu na olili ya. Ụfọdụ ndị ụlọụka ya na di ya bụ Trinity House, so ezinaụlọ ya gbakọọ ịgwa ya okwu ikpeazụ tupu e lie ya. Lee ka ya bụ emume si aga ebe a: Mara na a e mere emume ịmụanya abalị akwamozu n'ụbọchị 18 nke ọnwa Juun a. Onye ose foto ama ama bụ TY Bello (Toyin Sokefum-Bello) gosipụtara site n'akara Instagram ya. Bello bụ enyi ya wepụtara ebumnobi ikpeazụ Ibidunni Ighodalo degara ya n'ozi nkata ha nwere tupu ọ nwụọ. TY Bello were foto mparịtaụka ahụ Ighodalo degara ya tinye na instagram ya, nke mere ka ndị mmadụ gosiwe nwute ukwu maka ọnwụ ya. Ighodalo dere si na ọ ga-agba afọ iri anọ n'ọnwa Julai na-abianụ, mana ihe kachasị ya mkpa bụ ime ka ezinụlọ iri anọ na-achọ nwa kuru nwa ha n'aka. O dere na ọ chọghị oriri na nkwa so ncheta ụbọchị ọmụmụ ya kama ka ezinụlọ iri anọ nwebe aṅụrị. Ndị mmadụ ka na-aga bee Ibidunni Ituah-Ighodalo bụ nwunye ụkọchukwu Ituah Ighodalo nwụrụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Junu, iti ndị bee ya aka n'obi. Ndị ntaakụkọ BBC gara bee ya dị n'Ikoyi were setee foto ka ebe ahụ dị n'ụtụtụ a. Ha hụkwara na e dowere akwụkwọ nkwanye ugwu ikpeazu ebe ndị mmadụ na-edebanye aha na bee Ibidun nwụrụ anwụ. Ndị mmadụ nọ n'elu soshal midia eto di Ibidunni Ituah-Ighodalo bụ nwaanyị nwụrụ ụnyahụ bụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Junu. Ha na-ekwu na agbanyeghị na nwoke ahụ nụchara maka ọnwụ nwunye ya, ọ gara ebe akpọrọ ya ka ọ bịa ka ụka akwamozu ụbọchị ahụ. Ibidunni Ituah-Ighodalo bụ nwaanyị turu ugo dịka onye kachasị maa mma, bụ nwunye ụkọchukwu Ituah Ighodalo, nwụrụ ụnyahụ bụ ụbọchị iri na anọ nke Junu. Ighodalo nke di ya bụ ụkọchukwu nwe ụlọụka Trinity House dị na Legọs, nọ na-akwado ime ncheta ọmụmụ ya n'ọnwa Julaị, tupu ọ nwụọ. Lawal Nurudeen bụ onye na-elekọta ụlọọrụ Ibidun bụ Elizabeth R, kwuru na Ibidunni nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Juun, n'ụlọoriri na nkwari dị na Pọtakọt, Rivas steeti, ebe ha gara ọrụ ndozi. N'okwu Lawal gwara BBC, o kwuru sị ""Ihe m ma bụ na ọ labara ụra n'abalị ụnyaahụ mana o tetaghị ọzọ n'ụtụtụ a"". Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ihe e ji echeta ya bụ na ọ mụtaghị nwa ka o mechara In vitro fertilisation (IVF) ruru iri na otu (IVF bụ usoro sayesnsị si enyere nwaanyị aka ịtụta ime), mana o kutere ụmụ abuọ ya na di ya na-elekọta. Ibidunni bụ onye ojiegoachụego nakwa onye na-adụ ndị mmadụ ọdụ gbasara alụmdinanwunye, hibere ụlọ enyemaka n'efu na-enyere ezinaụlọ ndị na-achọ nwa aka. Ya na di ya gbara akwụkwọ afọ 13 gara aga. Ọnwụ ya akpalitela okwu na soshal midia, ebe ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ezigbo mmadụ nwere obi ọma." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53042308 +health Covid-19 testing:UNTH Enugu amalite ọrụ dịka ebe nnyocha ọrịa Coronavirus UNTH Enugwu ebidola ọrụ ụbọchị Monde dịka ebe nke abụọ a na-eme nnyocha coronavirus n'mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ Naijiria. https://www.bbc.com/igbo/afirika-53157338 +health Ile anya n'ara nwaanyị ọ na-agbati ndụ nwoke ? Ndị ọkachamara n'ihe gbasara mmekọrịta ahụ nwoke na nwaanyị ekwuola hoha na o nweghị mgbe nchọpụta sayensi ji kwuo na nwoke ịchado nwaanyị anya n'ara ga-adọtị ndụ ya. Otu onye n'ime ha aha ya bụ Pamela Udoka, BBC Igbo jụrụ maka ya bụ nchọpụta sị na ọ bụghị eziokwu n'ogo sayensi kwuru na onye ọbụla buputere nchọpụta ahụ mere ya ka aha ya wuo ewu. Mana onye ọzọ bụ Mmirimmasinachi Ekechukwu kwuru na ọbụrụ ma uche nke ya, ya bụ ihe nwekwara ike ịbụ eziokwu. Lee ihe Ekechukwu kwuru: Lee ihe Pamela Udoka kwuru: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50154445 +sports Liverpool vs Barcelona: Ndị ụka taa dịka otu Barcelona - Fr. Mbaka "Father Mbaka agwala ndị ụka ha ghara ịnọzị chakoo dịka Barca ganye na Liverpool edula ha mmuọ. O kwuru na asọmpi bọọlụ ahụ kwesịrị ikuzịrị ndị otu kristi ka ha wepu mpako na ndụ ha. Mbaka kwuru na nke a gosiri ihe akwụkwọ nsọ kwuru na nganga buru ụzọ, ọdịda esoro ya n'azụ, Nke a bịara n'ekpere ụbọchị Wenezde ọbụla ya bụ ""I no dey again"" na obi Adoration Umuchigbo, Iji Nike Enugwu. Ọ dọrọ ndị ụka katọliki aka n'nti ka ha ghara ịdị na akatọ ya kama ka ha mara na oge eruola mgbe ụka ga agbanwe. Ọ gwara ha nabata na ọtụtụ na agbagazị ụka pentecostal maka amụma na ihụ ọhụ. Mbaka kwuru na-agbanyeghị mmekpa ahụ ọbụla na ya ga akachị ntị na ebu amụma, ekpe ekpere, agwọ ọrị na ahụkwa ọhụ. Na ọ bụ na-aha Chukwu nna, nwa na mụọsọ onye nyere ya onyinye ahụ ka o ji aga." https://www.bbc.com/igbo/afirika-48209477 +entertainment 'O nweghi ọrụ ọbụla a ga-enye m ga-eme ka m kwụsị ịgba egwu' - Chekwas Michael Mana Chekwas Michael hụrụ na ịgba egwu bụ ihe na-enye ya obi aṅụrị wee foro ntutu taa na ya ga na-agba egwu agbanyeghi na nne ya machiri ya ime nke ahụ. Mgbe ọ gụchara akwụkwọ ma ọ hụghị ọrụ, ịgba egwu napụta ya mee ya ọ bụrụ onye na-enye ndị mmadụ ọrụ ugbua. Lee ka o siri mee ya https://www.bbc.com/igbo/55326228 +health Coronavirus: Gịnị mere ọnụọgụgụ ndị nwere ọrịa a na Naịjirịa ji arị elu? "Pịa ebe a ka ị hụ ebe coronavirus kachasị emetụta ndị mmadụ n'ụwa. Ọtụtụ mmadụ na soshal midia na-ada ebube etu ọnụọgụgụ ndị bu nje coronavirus jiri rie elu ruo dịka ndị a chọpụtara nwere ọrịa a ruru 1552, nke gụnyere mmadụ 195 a chọpụtara n'abalị Tuzde. Ngalaba na-egbochi ọrịa Bekee kpọrọ ""Nigerian Centre for Disease Control"" (NCDC) bụ ndị wepụtara ọnụ ọgụgu ọhụrụ a n'akara Twitter. NCDC na-enye akara mmadụ ole gbakerela na mmadụ ole nwụrụla. Nke a na-abịa ka Naịjirịa nọ ihe karịrị otu ọnwa na mmachi ngagharị nke bidoro n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Maachị. Dịka onyeisiala Buhari siri kwuo n'oge ọ manyere mmachi ngaghari a, ọ bụ iji belata mbanwanye nje coronavirus ma hazie etu a ga-esi buso ya agha ọfụma mere o jiri wepụta atumatụ ahụ. Nke a mere ụfọdụ mmadụ, dịka onye ji akara @_oluwatobiiii, ji ajụ ihe mere eji ekwu okwu mmepe na-agbanyeghi na nje coronavirus na-abanwanye. Ma sị na ya achọghị atumatu ahu ọzọ. Onye ọzọ ji akara @zizoholic ede sị na etu ihe siri kwụrụ ugbua mere ka ya na-ajụ ọrụ mmachị ngagharị rụrụ. @MaraAzuh sokwa tie mkpu maka ọnụ ọgụgụ ọhụrụ a. Ọtụtụ ihe kpatara ọnụọgụgu a ji na-abanwanye mana nke kachasị nke bụ ihe Bekee kpọrọ ""community transmission"". Ọzọ bụ mwulite nnyocha ndị mmadụ. Lee nkọwa atụmatụ abụọ: 1) 'Community transmission"" Community transmission, bụ nke Igbo na-akpọ ""mfesa n'ime obodo"", pụtara mgbe ndị mmadụ bi n'otu ebe malitere ịbunye onwe ha ọrịa ọbụla n'abụghị nke ha butere n'aka ndị si njem bịa n'obodo ahụ. Onye mbụ a hụrụ ọrịa Coronavirus n'ahụ ya na Naịjirịa bụ otu nwoke onye Italy bịara njem na Naịjirịa mana ugbua, ọrịa ahụ ebidola mfesa n'ime obodo. Na Legọs ebe ọnụọgụgụ kachasị maọbụ ""epicentre"" na Bekee, Gọvanọ steeti ahụ bụ Babajide Sanwoolu kwuru na ọ bụ n'ọnọdụ ahụ ka steeti ya nọ. Nke a pụtara na ọ dịzi mfe mmadụ ịbunye ya ibe ya nke mere na ọtụtụ mba ka machiri ọgbakọ ọha mmadụ nakwa ịmanye iwu akwa mkpuchi ihu iji belata ya bụ mfesa. 2) Mwulite ihe niile gbasara nyocha Kemgbe onye mbụ butere ọrịa ahụ, ngalaba NCDC na-agbasi mbọ ike ịwulite nnyocha ndị mmadụ. Dịka ha si kwuo n'akara Twitter ha ""nnyocha bụ isi mbido mbelata mfesa ọrịa a"" Ugbua, enweela ụlọ nnyocha iri na asaa ma na-akwado kwa ịtinye ọzọ. Ụlọ nnyocha ndị a ebidola iji usoro ""COBAS"" ga-eme ka e nwee ike inyocha mmadụ narị itoolu na iri isii n'ime elekere asatọ Ihe ndị niile na arụtụ aka na onụọgụgụ ka nwere ike ịgbalite dịka a na-achọpụta ndi mmadu ọhụrụ. Na Amerịka, bụ be ndị bu nje a ruru otu nde ụnyaahụ, Onyeisiala Donald Trump sị na ọ bụ maka nnyocha ha na-emesi ike mere e ji achọpụta ndị mmadụ n'ike n'ike. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwukwa na ime nnyocha n'igwe ga-enye aka imata etu ọnọdụ mba ọbụla si kwụrụ n'okwu coronavirus a." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52472920 +politics Nnamdi Kanu: Ihe Falana, Nwala na Ezeife kwuru maka iji mkparịtaụka udo tọhapụ Nnamdi Kanu Okwu iji mkparịtaụka udo tọhapụ onye ndu otu 'Indigenous People of Biafra' bụ Nnamdi Kanu ka na-arị ibe ya elu. Kemgbe ndị okenye Igbo sịka Mbazulike Amaechi, Chukwuma Ezeife na ndị ọzọ gachara zute Onyeisiala Buhari maka okwu a, ọtụtụ ndị gbapụtara ihe etinyela ọnụ na ya. Ọkaiwu na-ahụ maka ikike dịịrị onye bụ Femi Falana sị na Gọọmentị Etiti kwesịrị ige ntị n'oku a ha kpọrọ maka iji ụzọ udo tọhapụ Kanu na Sunday Adeyemi a ma dịka 'Sunday Igboho'. O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ ndị ụlọọrụ mgbasaozi Arise TV jụrụ ya banyere njem ndị a mere. Ọ sị na ọ dị n'Iwu Naịjirịa ma bụrụkwa ikike ọkaiwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami ịkagbu ebubo ọbụla gọọmentị boro mmadụ. Falana sị na ọ ga-ara gọ���mentị ahụ igosi akaebe n'ebubo ha boro Nnamdi Kanu nke a kpọrọ 'sedition' bụ nke a kagburu n'iwu Naịjirịa n'afọ 1983. Ọ gakwara n'ihu sị na otu ịchọ nnwereonwe ha emegideghị iwu na-achị Naịjirịa n'ụzọ ọbụla. Ọ sị ọ kaara gọọmentị mma iji mkparịtaụka udo n'okwu banyere Nnamdi Kanu na Sunday Igboho. N'otu aka ahụ, onyeisi otu 'Alaigbo Development Foundation' (ADF) bụ Ọkammụta Uzodinma Nwala sịrị na ịtọhapụ Nnamdi bụ otu ihe dị mkpa. Ọ sịrị na o nweghi onye ga-agba nkịtị ma a nwụchie nwa ya na-emeghi ihe ọbụla banyere ya. Nwala, onye toro ndị okenye Igbo gara hụụ Buhari maka okwu Nnamdi Kanu sịrị na ihe ọzọ kachasị mkpa bụ ileba anya n'ọnọdụ ndị Igbo na Naịjirịa. Ọ sị na e kwesịrị ịnọkọ ọnụ kparịa ụka maka etu a ga-esi mee ka ndị Igbo soro n'ihe a na-eme n'ala Naịjirịa. Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ Chukwuemeka Ezeife bụ aka chiburu Anambra Steeti bụkwa otu n'ime ndị so mee njem ahụ. Mgbe ọ na-aza ajụjụ n'Arise TV banyere njem ha, Ezeife sị na o nwere olileanya na Onyeisiala Buhari ga-eleba anya n'arịrịọ ha rịọrọ. Ọ sị na obi dị ha ụtọ etu onyeisiala si nabata ha ma gee ha ntị, na o gosiri na ọ ga-eleba anya n'eziokwu. Ezeife kwukwara na ndị nọ onyeisiala nso mere ka ha mata na olileanya dị na ozi ha ziri anwụrụ ọkụ ga-eru eluigwe. Mana otu dị iche iche si na mpaghara ugwu ekwuola ka Onyeisiala Buhari ghara ige oku a ndị a kpọrọ ntị. Ha sị na e nweghi etu a ga-esi atọhapụ onye ha sị ndị otu ya wakporo ma gbuo ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa. Ha gaara n'ihu sị na ọ bụrụ gọọmentị tọhapụ Nnamdi Kanu na ọ ga-abụ ihe ịmaatụ ọjọọ nye Naịjirịa n'ọnọdụ dị etu a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-59384470 +sports African Women Cup of Nations 2022: Lee ụmụasa ga-anọchiteanya Naịjirịa n'asọmpi a Asọmpi Iko Mba Afrịka ụmụnwaanyị nke ugboro iri na anọ ga-ebiri ọkụ na Satọde 2, Julaị 2022 na mba Moroko. Otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ Super Falcons ga-eso ụmụagbọghọ ibe ha pụta n'ọgbọ. Super Falcons bụ ọkaibe n'Afrika ma a bịa n'asọmpi a dịka ha maburula iko a ugboro iri na otu n’ime iri na atọ a gbarala ya. Na mbido asọmpi a, ha ga-ezute ọgbọ ha ndị dịka Saụt Afrika, Burundi na Botswana. Ụmụagbọghọ iri abụọ na ise na-agba bọọlụ n'otu egwuregwu dị icheiche n'ụwa ga-anọchiteanya Naịjirịa n'asọmpi a. Ndị a gụnyere: Chiamaka Nnadozie Ọ na-eyi uwe e dere akara iri na isii Ọ bụ otu n’ime ndị oche goolu ndị Super Falcons Otu egwuregwu ya bụ Paris FC dị na mba France A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Disemba, afọ 2000. Tochukwu Oluehi Oluehi na-eyi uwe e dere 1, Ọ na-echere ndị Super Falcons bọọlụ Otu egwuregwu ya bụ Maccabi Kishronot Hadera  dị na mba Isreal A mụrụ ya n’ ubọchị abụọ nke ọnwa Mee afọ 1987. Yewande Balogun Ọ na-echere ndị Super Falcons goolu A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 1983 Otu egwuregwu ya bụ Coppermine United dị n’Amerịka Onome Ebi Ọ na-eyi uwe e dere akara ise Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe azụ a kpọrọ ‘defence’ na Bekee A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Mee afọ 1983 Otu egwuregwu ya bụ Ev Avant Guingamp dị na France N’afọ 2019 ọ bụ nwafọ Afrịka mbụ gbarala asọmpi Iko Mbaụwa ugboro ise Michelle Alozi Ọ bụkwa Nwafọ Naịjirịa a mụrụ n’Amerịka Ọ na-agbara Super Falcons n’ebe azụ (defender) A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Eprelụ afọ 1997 Otu egwuregwu ya bụ Houston Dash dị n’Amerịka Glory Ogbonna Ọ na-eyi uwe akara anọ Ọ na-agbara Super Falcons n’ebe azụ (defender) A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Disemba afọ 1998 Otu egwuregwu ya bụ Santa Teresa FC dị na Spain Osinachi Ohale Ọ na-eyi uwe akara atọ Ọ na-agbara Falcons bọọlụ n’ebe etiti azụ (centre back) A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Disemba, 1991 Otu egwuregwu ya bụ Depotivo Alaves nke mba Spain Ashleigh Plumptre Ọ bụ nwafọ mba Briten mana nna ya bụ onye Naịjirịa (yoruba) si na Legọs steeti Ọ na-agbara Super Falcons n’ebe azụ (defender) Ọ malitere ịgbara ha bọọlụ n’ọnwa Febụwarị afọ 2022. A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Mee afọ 1998 Otu egwuregwu ya bụ Leicester dị na mba UK Akudo Ogbonna Ọ na-agbara Super Falcons n’ebe azụ (defender) A mụrụ ya n’ụbọchị itoolu nke ọnwa Eprelụ afọ 2000 Otu egwuregwu ya bụ Edo Queens dị na Naịjirịa Nicole Payne Ọ bụ nwafọ Naịjirịa a mụrụ na mba Amerịka Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe azụ (defender) A mụrụ ya n’ụb���chị iri na asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2001 Otu egwuregwu ya bụ West Virginia University dị na mba Amerịka Ya na nwanne ya nwaanyị bụ Toni Payne bụ ụmụnne abụọ nke mbụ ga-agbara Naịjirịa bọọlụ otu oge. Peace Efih Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder) A mụrụ ya n’ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2000. Otu egwuregwu ya bụ Kiryat Gat dị na mba Israel Ngozi Okobi Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder) A mụrụ ya n’ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Disemba afọ 1993. Otu egwuregwu ya bụ Eskilstuna United dị na mba Sweden. Toni Payne Ọ bụ nwafọ Naịjirịa a mụrụ na mba Amerịka Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder) A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Eprelụ afọ 1995 Otu egwuregwu ya bụ Sevilla dị na mba Spain Christy Ucheibe Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder) A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Disemba afọ 2000 Otu egwuregwu ya bụ SL Benfica nke Portugal Halimatu Ayinde Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder) A mụrụ ya n’ụbọchị iri na isi nke ọnwa Mee afọ 1995 Otu egwuregwu ya bụ Eskilstuna United dị na mba Sweden Regina Otu Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder) A mụrụ ya n’ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1996 Otu egwuregwu ya bụ Minsk FC dị na Belarus Rasheedat Ajibade Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder) A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ ọnwa Disemba afọ 1999 Otu egwuregwu ya bụ Atletico Madrid mba Spain Francesca Odega Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe ihu (forward) A mụrụ ya n’ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Ọktoba 1993 Otu egwuregwu ya bụ CSKA Moscow dị na Russia Uchenna Kanu Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe ihu (forward) A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Juun 1997 Otu egwuregwu ya bụ Tigres Femenil nke Mexico Rita Chikwelu Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder) A mụrụ ya n’ụbọchị isii nke ọnwa Maachị afọ 1998 Otu egwuregwu ya bụ Madrid CFF di na Spain Vivian Ikechukwu Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe ihu ( forward) A mụrụ ya n’ụbọchị iri nke ọnwa Julaị afọ 1997 Otu egwuregwu ya bụ WFC Gintra dị na Lithuania. Ifeoma Onumonu Ọ bụ nwafọ Naịjirịa a mụrụ na mba Amerịka Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe ihu (forward) A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Febụwarị afọ 1994 Otu egwuregwu ya bụ NY/NJ Gotham FC dị n’Amerịka. Chinonyerem Mcleans Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe ihu (forward) A mụrụ ya n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba 1999 Otu egwuregwu ya bụ GSK Gornik Leezna dị na Poland. Asisat Oshoala Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe ihu (forward) A mụrụ ya n’ụbọchị itoolu nke ọnwa Ọktoba afọ 1994 Otu egwuregwu ya bụ FC Barcelona di na Spain. Gift Monday Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe ihu (forward) A mụrụ ya n’ụbọchị itoolu nke ọnwa Disemba afọ 2001 Otu egwuregwu ya bụ Bayelsa Queens nke Naịjirịa. Randy Waldrum Randy Waldrum bụ onye nchịkọta otu Super Falcons nke Naịjirịa. Ọ bụ nwafọ mba Amerịka ihe egwuregwu bọọlụ doro anya. A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Sepụtemba, afọ 1956. Ọ bụkwa onye nchịkọta otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị nke mahadum Pittsburgh Panthers. https://www.bbc.com/igbo/articles/cpvzx365k94o +health 'Sepsis' ọrịa na-egbu rue ka kansa "Kwa afọ, otu n'ime mmadụ ise na-anwụ site n'ọrịa 'Sepsis' nke bụ ọnọdụ na-adapụta oge nje banyere ọnya maọbụ oghere n'ahụ mmadụ. Ewezụga imebi ihe dị ezi mkpa n'ahụ mmadụ, ọrịa a na-egbu mmadụ ruo ka ndị na-anwụ site n'ọrịa kansa. Dịka nchọpụta WHO siri kwuo, mmadụ nde isii na-anwụ n'ihi ọrịa 'sepsis' kwa afọ, ebe kansa na-egbu mmadụ nde itoolu n'ụma. WHO kwụkwara na n'ime otu n'ime mmadụ iri nwụrụ n'ịmụ nwa, ihe karịrị pasent 95 bụ 'sepsisi na-ebute ya. Akwụkwọ 'English-Igbo Medical Dictionary' kọwara 'sepsis' dika ""nje ịbanye n'ọnya maọbụ n'ọrịa nke na-eme ka o ruo abụ."" N'otu aka ahụ, Dokịta Ikechukwu Okoroafor kpọrọ ya ọrịa nje ịbanye mmmadụ n'ahụ. Na nkowa ya, Dọkịta Okoroafor kwuru na ọrịa a na-adị ụzọ abụọ; 'Sepsis' na 'Septicaemia. ""Septicaemia bụ nje ahụ ịbanye n'ọbara mmadụ."" Ọ gara n'ihu kwuo na afọ jọrọ ọrịa 'sepsis' njo n'ihi na ""o nwereike imebi akụrụ, imeju maọbụ obi mmadụ ma gbuo onye ahụ ma ọ bụrụ na a chọpụtaghị ma gwọọ ya n'oge."" Onye ọ bụla nwere 'infection' nwere ike ọ banye na 'sepsis'. Ihe e ji agwo 'sepsis' Ọgwụ na-egbu nje a kpọrọ'antibiotics' ka eji agwọ 'sepsis'. Dika Dọkịta Okoroafọ siri kọwaa, e nwere ike ibute ọrịa 'sepsis site na;" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51152991 +health Drug abuse effects: Etu ọgwụ ike 'kush' si akpa mkpamkpa Ndị na-ese ihe osise a kpọrọ 'kush' na mba Sierra Leone kọwaara BBC etu o si eru ha aka na ihe ndị ha na-eme iji nweta ya. BBC nụrụ akụkọ na ọtụtụ ndị ntorobịa na-egbu onwe ha, emerụ onwe ha maọbụ ndị ọzọ ahụ, wee gaa mee nchọpụta maka ya bụ ihe. Dịka akụkọ si kwuo, ọ naghị ara ha ahụ ịgwọkọ, dịka ha na-eji ụdịrị kemịkal nwereike ikpalite ụbụrụ gbaa n'elu otu ụdịrị akwụkwọ nri. Otu n'ime ndị na-ese kush aha ya bụ Isha, kwuru na ọ na-agba akwụna iji nweta ego o ji azụta ya. O kwukwara na ọ na-ara ya ahụ ịkwụsị, n'agbanyeghi na ya bụ 'kush' egbuola ụfọdụ ndị enyi ya. Onye ọzọ, Tindem, kwuru na ọ na-ese ya bụ 'kush' iji nweta onwe ya ma ọ rụchaa ọrụ ya bụ ịkpa alumi. Mana ọ gwara BBC na ọ na-agbalị ịkwụsị ise kush ka o wee dịrị ụmụ ya abụọ ndụ. O kwukwara na o nwere mmasị ịbụ ọgbabọọlụ a ma ama. Ndị ọrụ ahụike n'isiobodo Freetown kwuru na ihe ruru pasentị iri itoolu (90%) ụmụnwoke a na-edubata n'ụlọọgwụ ebe a na-elekọta ndị isi gbakara, bụ ọgwụ kush a tinyere ha n'ọnọdụ ahụ. Ndị uweojii mba ahụ na-ebukwa agha na-emegide ya bụ ọgwụ ike. E nwere ụdị ahịhịa 'cannabis' nke a na-e si na mpaghara Kush nke mba Afghanistan enweta, a na-akọ ụdị 'cannabis' nke a 'kush'. Mana e nwekwara ụdị ọgwụ ike ọzọ a na-akpọ 'kush', nke a bụ nke a na-enweta site na ngwokọ kemịkalụ dị icheiche. Aha ọzọ bekee na-akpọ ọgwụ ike a bụ 'kush' bụ 'synthethic marijuana'. Ọgwụ ike a na-eme ka ụbụrụ ndị na-ese ya gbalie elu nke ukwuu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-60282426 +entertainment Nicki Minaj: ihe isii ị maghị maka nwada a na-apụ ọkụ "Otiegwu mba Amerịka Ama ama bụ Nicki Minaj ekwuola na ya n'achịsa ọwa n'ihe e jiri mara ya. Minaj onye kwuru nke n'ụbọchị Tọzde ekwughị ihe o ji ahapụ ọgbọ ugbua karịa na ya na-aga ibido ezinaụlọ mana o kwughị ma ọ dị ime. Cheta na nsonso a ọ gbara ama na ya na Kenneth Petty gara kwegharia nkwa alụm di na nwunye. Ọkwa ahụ ọ mara adịghị ndị ihe ya na-amasị mma dịka ha wujuru soshal midia na-atụ arịrị maka ya. Ihe ise ịmaghị maka ya: Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu agọrọla isi onwe ya n'okwu na-efegharị na ọ ga-akpọlata ndị IPOB ọbụla nọ na Sawụt Afrịka na-efu maka okwu Xenophobia. Onye aka nri ya bụ Paul Achalla ama a n'ekwentị mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ya. N'ọnụ Achalla ""Nnamdi Kanu agwala ndị Ipob ọbụla ha kwụsị ịga Naịjirịa kemgbe edenyere aha ha dịka otu ndị na-eyi ndụ egwu"" Okwu a na-abịa dịka gọọmentị Naịjirịa họpụtara ụgbọelu Airpeace iji bulata ụmụ Naịjirịa ọbụla chọrọ ịsi mba Sawụt Afrịka lọghachite. Ụlọọrụ Efcc ekwuputala aha mmadụ iri na abụọ gụnyere otu onye ọkammụta na Mahadum Ahmadu Bello maka mpụ na igwu wayo. Akpụpụrụ ndị a ụlọikpe ebe onye ọkaikpe nyere iwu ka ọkwụọ dọlla nde iri n'ụgwọ mgbapụta rue mgbe a ga-anụ ikpe ya ọzọ. Aha ndị ahụ bụ Olaleye Kolapo, Madukife Ifeanyi Azuka, Fatanmi Yinka Sunday, Adebayo Bolaji Adeyinka, Adeleke Peter na Adebowale Fadairo. Ndị ọzọ bụkwa Oyewunmi Toulope Michael, Bello Ayoade Jalal Arikalam, Owolabi Toheeb Toluope, Abdullahi Abdulazeez Oluwatobi, Temitope Fatolu na Adesina Adewale. Aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi agaala njem nleta n'obi ghọọmentị etiti bụ Aso Rock izute onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari. Amabeghị ihe ndị ha ga-akpa mana ọ ga-apụta ihe n'oge adịghị anya. Mba Madagascar esorola nzọmụkwụ mba Zambia n'ịsepụ ụkwụ ha n'asọmpị enyi na enyi dị n'etiti ha na mba Saụt Afrịka. Madagaska mere nke a iji gosi uche ha gbasara okwu Xenophobia na-ewu na Saụt Afrịka. Samson Siasia bụ aka na-achịkọta bu otu egwuregwu bọọlụ Naịjrịa emeela mkpesa banyere mmachi ebighebi nke FIFA machiri ya. O kwuru na mkpesa bụ iji gosi na aka ya kwụ ọtọ n'ebubo niile eboro ya. Ozi na erụ anyị ntị ugbua na-akọwa na gọọmentị mba Saụt Afrịka emechiela ụlọọrụ nnọchite anya ha dị na Legọs, Naịjirịa. Ha sị na ọ bu maka ịchekwa ndi ọrụ ha dịka ngagharị iwe emere na Legọs butere ndị mmadụ ịwakpo ulọ ọrụ ndị ha sị ndị Saụt Afịrịka nwe. Nke a na-abịa n'azụ Naịjirịa kpọlatala onye nnochite anya ha na Saụt Afịrịka. Naịjirịa gbajọkwara nzụkọ ngalaba ""World Economic Forum"" Osote Onyeisiala Osinbajo kwesiri ịnọ na ya. Dịka ịkpaoke agbụrụ nke Saụt Afrịka na-aga n'ihu, Ụlọọrụ ụgbọelụ Airpeace ekwụọla na ha ga-eweputa ụgbọelụ maka ndị Naịjirịa niile chọrọ ịlọta. N'akwụkwọ ọ degara Minista na ahụ maka mekọrịta ndị mba ọzọ bụ Geoffrey Onyema, onyeisi ọrụ Airpeace bụ Oluwatoyin Olajide kwụrụ na agaghị agba nkiti ka ya bụ ewụ mụọ n'ọgbụ. Ụlọikpe n'Amerịka awụọla Exxon Mobil na Royal Dutch Shell n'ala gbasara akwụkwọ ha gbara ụlọọrụ mmanụ agbidi Naịjirịa bụ NNPC. Exxon Mobil na Shell rịọrọ ya bụ ụlọikpe ka ọ manye NNPC ka o kwụọ nha otu ijeri dọla na ụma asatọ maka na ọ mezughị nkwa ha ịmịta mmanụ n'afọ 1993. Mana ụlọikpe jụnyụrụ anya pịị. Leekwanụ na-atụọla nwụnye onye chiburu Honduras bụ Rosa Elena Bonilla nga afọ iri ise na asatọ maka mpụ na oke ego asị na omefuru mgbe dị ya nọ n'ọchịchị site n'afọ 2010 ruo 2014. Ọkaiwu ọrịakụ Bonilla na-ekwusi ike na aka ya bụ nwaanyị dị ọcha na ya ga-aga ụlọikpe mkpegharị iji zọpụta ya na ndagwuru nke ọnwu. Asọmpi itozuoke iko mbaụwa 2022 malitere n'ikem n'ikem ụbọchị Wenezde, mba iri abụọ na asatọ ọkpa esicheghị ike n'Afrịka ga-anwa ike ha maka isonye. Cheta na Naịjirịa na mba iri abụọ na isii ndị ọzọ nke Afrịka etozuolarị na echezi ibe." https://www.bbc.com/igbo/49592390 +politics Ihe Umahi, Ikpeazu nakwa gọvanọ ndị ọwụwaanyanwụ ndị ọzọ kpebiri maka akwa 'Second Niger Bridge' Ndị gọvanọ ọwụwaanyanwụ agwaala ndị nkuzi niile nọ na Naịjirịa ka ha ga mee nyocha maka covid 19. Onyeisi ọgbakọ ndị gọvanọ ọwụwaanyanwụ bụ David Umahi kwuputere nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ ka nzụkọ ha nwere n'elu intanet si gaa n'ụlọ gọọmenti dị na Abakaliki. Lee ihe ndị ọzọ pụtara n'ọgbakọ ahụ: 1. Umahi kwuru na ha tulere etu ọrịa coronavirus si metụta mpaghara ọwụwaanyanwụ ma na--ekwu na ha ga-atụle ihe gbasara ụlọakwụkwọ iji kwado atụmaatụ nile Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) wepụtara wee na-eche mgbe a ga-emepe ụlọakwụkwọ. 2. Mpaghara ọwụwaanyanwụ niile ga-amalite ime nyocha n'ụlọ n'ụlọ tụmadị ndị ruru ma gafee afọ iri isii na ise. 3. Ha rịọrọ ka onye bụbụ odeakwụkwọ gọọmenti Naịjiria, Anyim Pius Anyim na Arthur Eze bụ ide ji ego kwụsị esemokwu dị n'etiti ha ma kwe ka ndị gọvanọ ọwụwaanyanwụ dozie okwu na-esere ha. Ihe na-esere ha abụọ 4. Ha kelere onyeisiala Buhari ka o si wete ego eji arụ akwa mmiri Naịja nke abụọ nakwa ndozi ọdọ ụgbọelu Enugu. 5. Ha kwetere na a ga-emeperiri ọdọ ụgbọelu Enugu n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Ọgọstụ ma rụcha akwa mmiri abụọ nke Niger n'afọ 2022. 6. Ha kwetere na ha ga-akpọpụta aha ngalaba nchekwa ọhụru ga-echekwa mpaghara ọwụwaanyanwụ nile n'ọgbakọ ọzọ ha ga-enwe. 7. Ha kwetere na ha na gọọmenti etiti ga-etikọta aka wepụta ego a ga-eji rụ ụgbọ oloko ga-erute mpaghara ọwụwaanyanwụ. Ihe pụtara na nzuko ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ n'Enugwu n'ọnwa Febrụwarị Ndị gọvanọ na-achị mpaghara ọwụwanyanwụ nke Naịjirịa nwere nzukọ n'Enugwu Steeti taa. Ozi a si n'aka gọvanọ na-achị Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi bụ onye lere ha ọbịa n'obi ọchịchị ya dị n'Enugwu. Ndị so n'ọgbakọ ha gụnyere gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi, gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia na osote gọvanọ Anambra bụ Nkem Okeke. Ndị ọzọ bụ ọkanmụta Barth Nnaji, onyeisi ọgbakọ ha bụ ọkanmụta Simon Ortuanya na ndị ọzọ. Dịka ọ dị ugbua, amabeghi ihe ha kpatara na nzukọ a. Nwada Igbo chọtara ihu ọma n'aka gọvanọ Borno Steeti Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum ajaala Obiageli Mazi mma na ndụ maka uchu na mbọ ọ na agba n'ọrụ nkuzi ya. Gọvanọ ahụ mere njem mberede n'ụlọakwụkwọ ya bụ nwaanyi n'isi ụtụtụ Fraịde were zute naanị ya n'ọrụ n'elekere isii nke ụtụtụ. Gọvanọ buliri ya n'ọkwa ma nyekwa nwaego mmachiakpa. @henryshield kwuru na etu a esi gosipụta atụmaatụ a nwereike itinye ndụ nwaanyị a na nsogbu. @TeemahK1 na-eto gọvanọ Borno maka obioma ya. @ogundamisi na-eto onye nkuzi a maka etu o si nọrọ na-agba mbọ na steeti ahụ agbanyeghị ụfọdụ mmekpa ahụ na-eme ebe ahụ. @oil_shaeikh kwuru na ọ bụ etu Naịjirịa kwesiri , nihi na ekwesighị nwe nkewa. Ndị ụka Metọdisti emeela ngagharịiwe Ndị ụka Metọdisti nke Naịjirịa emeela ngagharịiwe megide oke ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ na Naịjirịa karịsịa ndị ụka Kraịst. Ọ bụ ụka Metọdisti nke ngalaba Opebi dị n'Ikeja nke Legọs Steeti mere nke a. Cheta n'izuụka gara aga, na onyeisi ụka Redeemed bụ Pastọ Adeboye na ndị ụka ya mere otu ngagharịiwe a n'ihi nchekwa na Naịjirịa. Ụlọikpe ndị agha Naịjirịa amaala mmadụ atọ ndị otu ha ikpe afọ iri maka iji arụrụala rụgbụọ onye otu ha. Majors Oseni, Ogbemudia Osawe, Captain Amosu na Second Lieutenant Nuhu Dogary gburu Bejamine Collins n'afọ 2017. N'ofesi, ndị agha mba Amerika ekwuola na egburu ndị agha ha mmadụ abụọ ma meruo isii ahụ na ọwụwa anyanwụ mba Afganistan. Ọnụ na-ekwuru ndị agha Amerika ebe ahụ bụ Sonny Leggett sị na onye mere ihe a yi akwa ndị agha Afganistan kpọpere mgbo ebe ndị agha ndị ọzọ nọ. Shieffield na Bournemouth N'egwuregwu, Sheffield United ga-ezute ndị Bournemouth n'elekere abụọ nke ehihie a na asọmpị premier league. Archi Bishop ndị Anglikan nke Enugu bụ Emmanuel Chukwuma ekwuola na kepu kepu a juru sosha media kemgbe na gọọmenti Enugu steeti ruru ụlọ ndị Alakụba bụ ọkpụrụ kpụrụ asi. Chukwuma sị ndị na-agbasa ya bụ asiri wepụ aka enwe n'ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ. Minista na-ahụ maka ọrụ na ụlọ, Babatunde Fashola ekwuola na iji mmadụ gwọọ ogwuego adịdghị ire ma rịọ ndị na-eme ihe nkiri ha ejizina ya eme ihe nkiri. Fashola kwuru nke a n'ọgbakọ ekpokobara maka nchekwa obodo ebe ọ nọ sị ndị ọnụ na-eru n'okwu kawa ahụ gwa ndị mmadụ nke bụ eziokwu. N'ofesi, ndị ọrụ nchekwa egbuola ya bụ onye agha gburu onyeisi ya nakwa mmadụ iri abụọ na Thai Land. Odobeghị anya ihe mere Jakraphanth Thomma jiri kpaa udi agwa ahụ mana Minista ahuike mba ahụ kelere ndị ọrụnchekwa maka ịkwụsị ya bụ nwoke. Raheem Sterling agaghị eso gbaa bọọlụ ndị West Ham N'egwuregwu, Manchester City ga-ezute West Ham taa na ọgbọegwuregwu ha bụ Etihad. Onyeegwu ha bụ Raheem Sterling agaghị eso gbaa maka ahụ o meruru mgbe ha na Tottenham gbara bọọlụ n'izuụka gara aga. https://www.bbc.com/igbo/afirika-51432481 +business Cashless Policy: Eziokwu dị na atụmatụ ọhụrụ a CBN wepụtara Ọtụtụ mmadụ na egosi mwute gbasara atụtụmatụ ọhụrụ ụlọakụ etiti bụ 'Central Bank of Nigeria' wepụtara nke a kpọrọ 'cashless policy' na Bekee. Atụmatụ a ga eme ka amịpụ ego dị pasentị abụọ ma ọ bụrụ na mmadụ gaa ịdọrọ ego karịrị puku narị naịra ise (N500,000) otu mgbe n'ụlọakụ ya. Onyeisi ụlọọrụ CBN bụ Godwin Emefiele kọwara na atụmatụ a bụ iji mee ka ndị mmadụ ghara ị na-ebugharị ọkpụrụkpụ ego n'aka. Emefiele kwukwara na ọbụ iji mee ka ndị mmadu gbasoo ụzọ isi n'ikuku maọbụ n'akara ịntanetị maọbụ akara ekwentị wee na ezipu maọbụ na-anabata ego. Mana ọtụtụ kwuru na atụmatụ a ga-eme ka ihe isiike rịwanye elu na Naịjiria. Ọtụtụ aghọtachaghị ya bụ atụmatụ, ha amaghịkwanụ etu ọ ga-esi adị ire. Ụlọọrụ CBN kọwara na ọtụtụ mmadụ ghọtahiere atụmatụ 'cashless policy'. Ha kwukwara na atụmatụ a abụghị ihe ọhụrụ kama na ha chọrọ ka ọ dizie ire nke ọma ugbua. N'eziokwu, onye wepụtara atụmatụ 'cashless policy' bụ Sanusi Lamido Sanusi oge ọ bụ onyeisi CBN. Atụmatụ a malitere n'abalị mbụ nke ọnwa Janụwarị afọ 2012 na steeti Legọs. N'ọnwa Julaị afọ 2013, e bidoro ya na steeti Abịa, Anambara, Kano, Ogun, Rivas nakwa Abuja. N'ọnwa Jụlaị afọ 2014 ka ọ gazuru obodo Naịjiria ọnụ. Iwu CBN nyere ugbu a bụ na onye chọrọ ịkwụnye maọbụ ịdọrọ ego karịrị puku narị naịra ise n'ụlọ akụ otu mgbe, a ga-amịrị pasentị abụọ. Mana pasentị abụọ ahụ bụ n'elu ego nke mara ama, ọbụghị n'elu puku narị naịra ise ahụ. Iji maa atụ, onye chọrọ ikwụnye N520,000, pasentị abụọ ọ ga-akwụ bụ n'elu N20,000 nke mara ama. Pasentị abụọ 20,000 pụtara narị anọ (400). Ya bụ, a ga-amịpụ narị naịra anọ n'ime N520,000. Ụfọdụ ndị ma ihe ekwe na-akụ n'ihe gbasara akụnụba na ego ekwuola na atụmatụ a ga ara ahụ. E nwere ndị kwuru na ihe dị otu a nwere ike ịme ka obi lọọ ndị mmadụ mmiri itinye ego ha n'ụlọakụ. Ndị ọzọ kwukwara na ọtụtụ ụzọ e si eji ịntanetị ezipu ego anaghị arụcha ọrụ nke ọma. Ebe ndị ọzọ kwukwara na ego a na-amịpụ n'akara ọbaego ndị mmadụ akarịala. Lee ụfọdụ ihe ndị mmadụ kwuru: @DrJoeAbah katọrọ atụmatụ ahụ ma jụọ ndị CBN ma ha che na Naịjirịa ka nọ n'ọchịchị ndị agha. @OgbeniDipo jụrụ ihe kpatara ọ ga-eji kwụchaa ụgwọ dị icheiche maka ego ya dị n'ụlọakụ bịakwa kwụọ ụgwọ ọzọ ma ọ chọọ ịdọrọ ego ahụ Ebee na ebee ka a ga-amalite atụmatụ a? Ka ọ dị ugbu a, atụmatụ cashless policy a ga-adị ire naanị na steeti Abịa, Anambara, Kano, Legọs, Ogun, Rivas nakwa Abuja. N'ọnwa Maach afọ 2020 ka ọ ga-ebiri ọkụ na Naịjirịa niile. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/49779822 +health SC Genotype - Gịnị ka ọ bụ? "Soshal midia enwurula ọkụ maka etu ndị mmadụ si ekwu na Olamimlekan eji Laycon mara bu genotype SC. Nke a mere ka ndị mmadụ jụwa maka ihe SC pụtara. Dọkịta ahụike bụ Chidi Akaghara kwuru na ọ bụ udiri genotype na-anaghị ada ụda ka genotype ndị ọzọ dịka AA, AS nakwa SS. O kwukwara na adaghị ụda ya mere ka ndị mmadụ ghara ị na-eme nchọpụta maka ya kamgbe. Mana dọkịta Mcginger Ibeneme kwuru na SC bụ udiri sickle cell ọzọ enwere, inwereike ịkpọ nwanne ""sickle cell."" O kwuru na onye bu SC genotype na-esi n'aka otu ndị mụrụ ya nweta S ma nweta C n'aka onye ọzọ . Njirimara ya yitekwara nke SS makana onye ahụ ga na-aya ahụ mgbe ọbụla. O kwukwara na anaghị ahụkarị udiri genotype a na Naịjirịa kama a na-ahụkarị ya n'etiti ndị si mba Carribean. Dọkịta Ibeneme kwuru na iron na-akọkarị n'ahụ onye bu SC nke mere na a ga-agbado anya na-achịkwalata ahụike onye ahụ. Ihe ise mere ndị 'NGO' jiri gbajọọ iwu 'sickle cell bill' Sam Egwu wepụtara A gụrụ akwụkwọ iwu maka mgbochi ọrịa okponọbara nke Bekee kpọrọ 'sickle cell' agba nke abụọ ya n'Ụlọomeiwu Ukwu ụbọchị Tuzde. Mana ọtụtụ otu abụghị nke gọọmenti na-agba mbọ maka ọdịmma ndị nwere ọrịa 'Sickle cell' gbajọrọ iwu ahụ nke Sam Egwu bụ Sinetọ na-anọchite Ebonyi-North n'Ụlọomeiwu Ukwu wepụtara. Ha kwuru na ndị haziri ya bụ akwụkwọ iwu akpọghị ndị ya bụ okwu ahụ metụtara (stakeholders) oku ka ha tụnye alo ga-eme ka iwu ahụ mịta ezi mkpụrụ. Ha rụtụkwara aka na okwu igbochi ụfọdụ mmadụ ịlụ onwe ha n'ihi ụdị ọbara ha nwere megidere ikike dịrị onye dị n'iwu Naijiria. Akwụkwọ iwu 'Sickle cell' Sam Egwu wepụtara n'ụlọomeiwu Naijiria chọrọ ka a enwee iwu nke ga-eme ọtụtụ ihe maka ọrịa okponọbara gụnyere : Mana ndị otu abụghị nke gọọmenti kwuru na ya bụ akwụkwọ iwu adabachaghị n'ihi ụdị asụsụ e jiri dee ya, na ihe ndị kwesịrị ka etinye adịghị na ya nakwa ihe dị na ya ekwesịghị ịdị ya. Lee ebe ụfọdụ ha kwuru iwu ahụ si eri mperi: Onye nchikọta National Sickle Cell Foundation bụ Dkta Annette Akinsete sị na ọ bụrụ na ha chọrọ ime ihe ndị mmadụ ga-anabata, na ha kwesiri ịkpọ ndị ya bụ ọrịa metutara na ndị ọkachamara n'ihe gbasara ""genetic counselling"" n'olu Bekee ka ha tụnye alo na ya bụ okwu a maka na anaghị akpụ mmadụ isi n'azụ ya. Toyin Adesola, onyeisi otu 'Sickle Cell Management and Advocacy Initiative' kwadoro ihe Akinsete kwuru sị,""Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe gbasara ọrịa okponọbara, ị kpọọ ndị maa maka ya, ndị na-arụ ọrụ gbasara ya nakwa ndị ya bụ ọrịa na-enye nsogbu."" 2. Ime ka ọ bụrụ ịda iwu mmadụ ịlụ onye masịrị ya Dkta Annette Akinsete sị na akwụkwọ iwu ahụ chọrọ i me ka ọ bụrụ ịda iwu mmadụ iso obi ya n'ihe gbasara ịlụ onye masịrị ya. ""Nke a megidere ikike dịrị onye dịka o siri dị n'iwu Naijiria. A ma m na ọ gaghị enwe isi."" Akinsete ji mgbe ndị agha na-achị n'Oyo steeti, mgbe ha chọrọ iti ụdị iwu ahụ bụ nke ọ sị mara afọ n'ala mgbe ahụ maa atụ. Akinsete kọwara mkpa nkuzi na mgbazi maka ọrịa okponọbara dị mkpa ma sị na ụfọdụ mmadụ na-esi onwu na ha ga-anụrịrị agbanyeghị ntuziaka niile e nyere ha. ""Nchọpụta gosiri na ụfọdụ na-ekpebi na ha agaghị amụ nwa, ha gaa kuru nwa."" ""O kwesiri inye ndị dị otu a ohere ikwu ka ha ga-esi jikọrọ onwe ha."" Winifred Otokhina nke TonyMay Foundation jụrụ ajụjụ sị na ọ bụrụ na e mee ya iwu na onye ọbụla ga-eme nnyocha ọbụla tupu ha alụọ, ma gbochie ndị nwere AS maọbụ SS ilụ onwe ha,""Kedụ maka ndị chee na ha nwere AA mana ndị lab edehie mpụtara ụdị ọbara ha nwere nke Bekee kpọrọ 'misdiagnosis'. 3. O kwesịrị ịbụ 'ibelata' ọ bụghị 'ikpochapụ' ọrịa okponọbara Ndị otu na-agba mbọ maka ọdịmma ndị nwere ọrịa okponọbara sịrị na ọ bụrụ na ndị omeiwu chọrọ ime ihe nke ọma, na ""ọnụ okwu ha kwesiri ịna-ekwu bụ maka 'igbochi', 'ịkwado ịgbasa ozi' na 'ịgbazị ụzọ' ọ bụghị 'ikpochapụ"" ọrịa okponaọbara, maka na ọrịa ahụ enweghị mkpochapụ. ""Ị nụ mkpochapụ, kedụ ihe ị chọrọ ime? Ị ga-egbuchapụ ndị niile nwere ọrịa ahụ?"" Akinsete sị na ọ bụrụgodi na e nwere ike ikpochapụ ndị nwere ike ibute ọrịa okponaọbara site na alụmdinanwunye, kedụ maka ndị na-amụta nwa na alụbeghị di? 4.Iwu ahụ ekwughị maka nsogbu dịrị ndị nwere ọrịa sickle cell Toyin Adesola nke Sickle Cell Management and Advocacy Initiative onye tụrụ arịrị sị na 'o nweghị ndị ọrịa a metụtara a kpọrọ oku sị n'iwu ahụ ezughị oke. Adesola sị na akwụkwọ ""iwu nke a elebaghị anya n'ọnọdụ ndị nwerela ọrịa okponaọbara na nsogbu ha na-ahụ inweta nleta ahụike zuru oke na Naijiria."" Ọ gara n'ihu kọwa na iwu ahụ na-ekwu maka naanị ndị nwere AS na SS ma chezọọ na e nwere ndị enweghị ụdị ọbara mana ha nwere ike ịmụta nwa nwere ọrịa okponọbara. ""Ụfọdụ amaghị ndịiche dị na-etiti ""genotype' na 'Blood Group.'"" Adesola gara n'ihu rịọ ka ""Ụlọoemiwu kpo oku ndị na-arụ ọrụ n'ihe gbasara ọrịa okponaọbara ka a kpa maka akwụkwọ iwu ahụ."" 5. O nwere ndị agụpụrụ n'iwu ahụ Winifred Otokhina nke TonyMay Foundation kwuru na akwụkwọ iwu ahụ ekwụghị maka etu a ga-esi enyere ndị nwere ọrịa okponọbara aka ịnata nleta na oke luru ha dịka mmadụ. Otokhina tụrụ arịrị na ""Ndị nwere okponaoba anaghị enweta ohere inweta ọrụ dịka ndị ọzọ"" mana iwu ahụ ekwughị maka ya. Mbọ BBC gbara inweta ọsịsa Sam Egwu amịtaghị mkpụrụ dịka ọ zaghị ekwentị ya nke ọ na-asa ozi e zigara ya n'ekwenti." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52664651 +politics Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ipob biko gbaghara - Ọhaneze Ndigbo "Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Ndị otu ntorọbịa Ohaneze Ndị Igbo akpọkuola ndị IPOB sị ha gbaghara ma kpee udo. Ha gwara IPOB sị na ndị agbụrụ na mpaghara ndị ọzọ na Naịjirịa ebidola ikwu maka nhazi nke bekee kpọrọ 'restructuring'. Otu na-ahụ maka mmegide na ikike mmadụ nwere bụ Amnesty International ebola ndị agha Naịjirịa ebubo iwakpo ụmụnwaanyị na ụmụagbọghọ nọ n'ogige ebe ha na-agba ọsọndụ maka Boko Haram. Ha kwuru na ndị agha na-ebu ụzọ kwe ha nkwa ịnyere aka site n'inye ha nri na ihe ndị ọzọ. Mana otu ọnụ na-ekwuchitere ndị agha kwuru na ọ bụghị eziokwu na ihe a na-eme. Okwu ""Nuclear"" Iran Onyeisiala ndị mba Germany bụ Angela Merkel ekwuola na China na Germany ga-akwụdo na nkwekọrịta ihe gbasara Nuclear nke ndị Iran, n'agbanyeghị na mba Amerịka pụrụ na mbido ọnwa a. Merkel kwuru nke a ka ya na Li Keqiang bụ onyeisiala ndị China zukọrọ oge ọ gara njem ọrụ ụbọchị abụọ na China. Ndị Enyimba ji otu ọkpụ goolu na-asataghị ihe merie Niger Tornadoes ụnyaahụ. Mmeri a mere ka Enyimba rigoo n'ọkwa asatọ na ndị kachasị agba n'asọmpi NPFL ugbua. Gee ya na nkeji nke ututu a: Onye na-akwalite egwu ụka ama ama bụ Anthony Umeh a.k.a Honesty Music ekwuola etu esi o si kwalite ndị ọgụegwu ụka dịka Frank Edwards na ndị ọzọ ama ama na Naijirịa taa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-44235636 +entertainment Ihe D’banj kwuru maka ebubo nzufu ego gọọmentị nọ n'isi ya D'banj onye ụlọọrụ a na-enyocha nrụrụaka, mpụ na okwu ndị nyiri ha na Naịjriịa bụ Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (ICPC) tọhapụrụ n'abali itolu nke ọnwa Disemba ezipụtala ozi banyere ebubo nọ n'isi ya, nwụchi nakwa ntọhapụ ya. A nwụchiri n’ụbọchị Tuzde maka ebubo nzufu ego gọọmentị nke n’atụmatụ N-Power. N'ozi o zipụtara n’akara Instagram ya na Fraịdee a, o kwuru “enweghi ihe jịkọrọ mụ na nzufu ego, naanị ikpori ndụ ka m ma”. “A tọhapụrụ m dịka m pụtara gosi ụlọọrụ a onwe m, enweghi ihe ha hụrụ n’aka.” Ọ gbara ama na ọ bụrụla onye nweereonwe ya ugbua. A tọhapụla D’banj bụ onye ụlọọrụ a na-enyocha nrụrụaka, mpụ na okwu ndị nyiri ha na Naịjriịa bụ Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (ICPC) nwụchiri n’izu a. Ọkaiwu ya bụ Pelumi Olajengbesi gbara ama nke a na soshal midia ya n’ụbọchị Fraịdee dịka ọ kesara foto na-egosi ebe D’banj nọ n’azụ otu ụgbọala. Olajengbesi kwuru na a tọhapụrụ maka na ọ bịara zara oku a gosi ụlọọrụ ahụ onwe ya. Cheta na ụlọọrụ ICPC gbara BBC ama n'ụbọchị Tuzde na ha nwụchiri otiegwu a ma ama dịka D’Banj. Ụlọọrụ a kwuru na ha nwụchiri Daniel Oyebanjo (D’Banj) n’okwu metụtara nzufu ego nke atụmatụ gọọmentị etiti wepụtara a kpọrọ  N-Power Programme. Atụmatụ N-Power a so na atụmatụ Onyeisiala Muhammdu Buhari wepụtara n’ebe mmalite ọchịchị ya n’afọ 2016 iji nyere ndị ntorobịa na-enweghị ọrụ aka ma wulite ọdịmma ndụ ndị mmadụ. N’ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Azuka Ogugua, binyereaka, ha kwuru na: “Dịka ọrụ anyị siri dị, anyị anatala ọtụtụ mkpesa banyere nzufu ego ruru nde kwuru ijeri naịra dịka gọọmentị etiti binyereaka ma wepụta ego ndị ahụ ka ha ruo n’aka ndị na-enweghị ka ọ hara ha” “Ọtụtụ n’ime ndị kwesiri irite uru n’atụmatụ a ezitereala anyị ozi na-ekwu na ego anaghị abata n’ọba ego ha agbanyeghị na gọọmentị na-ekwu ha akwụọla ha ụgwọ ha.” “Ụlọọrụ ICPC akpọọla ihe ruru mmadụ 10 oku ka ha zara ọnụ ha n’ihe gbasara nzufu ego a mana e mechara nye ha ohere ka ha si n’ụlọ na-abịa ikpe okwu a.” “Anyị kpọrọ Maazị Oladipo Daniel Oyebanjo oku ugboro ugboro ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ọ kpọrọ ekwu nkụ ghara ịbịa.” Ha gara n’ihu kwuo na D’Banj mechara were aka ya bịa isi ụlọọrụ ha nke mere ha jiri nwụchie ya n’ụbọchị Tuzde bụ ụbọchị isii nke ọnwa Disemba 2022. ICPC kwuru na Oyebanjo na-enyerezi aka n’ọrụ nnyocha ha na-eme ugbua n’okwu ebubo nzufu ego ndị a. Ha kwukwara na nnyocha ha metụtara ndị kwesiri irete uru n’aka atụmatụ ahụ, ụfọdụ ụlọakụ, nakwa ndị ọzọ ya bụ okwu dakwasiri. N’otu ozi ọ zipụtara n’akara Instagram ya n’ụbọchị 24 nke ọnwa Ọọgọst 2021, D’Banj kwuru na ọ bụ otu n’ime ndị nnọchịteanya ya bụ atụmatụ N-Power dịka ọ bụ onye a ma ama. N’ozi ahụ, o dere “A na m ekpughe agba BATCH C1 nke atụmatụ a so n’ime ọrụ ụlọọrụ NSIP” Ọ kesara foto emume ebe e mere ya bụ mkpughe dịka o kwuru “A ga-ahọpụta ndị ntorobịa mmadụ otu nde ma nye ha ego N30,000 kwa ọnwa ruo otu afọ dịka a ga-enye ha ọzụzụ n’ọrụ ọbụla ha họọrọ.” Mana gọọmentị etiti site na Ministri na-ahụ maka enyemaka ndị mmadụ bụ Federal Ministry of Humanitarian Affairs ezipụtala ozi gọpụ onwe ha na mmekọ ọbụla maọbụkwanụ njịkọ ọbụla n’ebe D’Banj nọ. Ministri bụ ndị ọrụ N-Power nọ n’aka kwuru na D’Banj bịara naanị ya bụ emume na ọ bụghị onye nnọchịteanya ha. Minista na-ahụ maka enyemaka ndị ọdachị zutere bụ Sadiya Farouq kwuru “Biko leghara ozi ọbụla na-ekwu https://www.bbc.com/igbo/articles/cp3y73mk835o +health Erectile dysfunction treatment: Nwoke kwesịrị idina nwaanyị ugboro 21 kwa ọnwa "Ọtụtụ ụmụnwoke na-ebugharị nsogbu ọrịa nkụda utu (erectile dysfunction) nke mere na ọ naghị ekeli etu na mgbe o kwesiri. Mana nsogbu kacha nke bụ na ọtụtụ ụmụnwoke anaghị ekwupụta nsogbu ha n'ihi ihere. Ụfọdụ ihe mere ụmụ nwoke anaghị achọ ịkpọ ya bụ okwu aha bụ maka na ha hụrụ utu (penis) ha ka njirimara ugwu nwoke maọbụ ihe nwoke jiri bụrụ nwoke. Nke a mere ha jhi ahụ ọrịa utu dịka ihe na-egosi na ha etozughị etozu dịka nwoke. Ọtụtụ ụmụnwoke chere na ikwupụta maka ọrịa utu nkụda ga-ewetara ha ihere na nleda ha anya, maọbụ bụrụ ihe e ji akọ ha ọnụ. Ihe ọzọ bụkwa na ha na-eche na ugwu ha akpụọla n'ala, nke mere na ha anahịzị achọ ka ha na ndị ọdịnaobi ha nwee mmekọ. Mgbe ụmụnwoke na ndị ọdịnaobi ha enweghị mmekọrịta ka ha kwesịrị, nke ahụ na-ebutekwa nsogbu dị icheiche n'etiti di na nwunye maọbụ ụmụnwoke na ụmụ nwaanyị na-eme enyi. Ọrịa nkụda utu bụ amụ nwoke enweghị ike ịkụli ọtọ ruo ihe dịka nkeji iri na ise. Ọrịa utu nkụda na-egosi onwe ya mgbe utu (penis) nwoke azaghị oku dike mgbe oge ruru. N'ihi na Igbo sị na mberede ka e ji ama dike. Nnyocha gosiri na pasentị iri na ise (%15) n'ime ụmụ nwoke dị n'etiti afọ 18 na 35 nwere ọnọdụ nkụda utu; ebe ndị karịrị afọ 40 na-arịa ya bụ ọrịa karịrị pasentị 40. Kedụ ka e si ama onye na-arịa utu nkụda? Ihe mbụ na-egosipụta na nwoke nwere ọrịa utu nkụda bụ mgbe utu ya ekelighị n'isi ụtụtụ, maọbụ mgbe utu ya anaghị akwụli ọtọ iji zuoro nwaanyị mgbe a na-enwe mmekọ. Utu nkụda abụrụla ọtụtụ ụmụnwoke mmekpa ahụ, nwereike igbu mmụọ nwoke. Ajụjụ gị na-agụ edemede a ga-ajụ bụ kedụ ihe nwereike ibute ya bụ ọrịa utu nkụda a? Kedụ ihe nwereike ibute ya bụ ọrịa utu nkụda a (erectile dysfunction)? Dọkịnta Rasheed Abassi, bụ dọkịnta ihe gbasara mmekọrịta doro anya na mba Amerịka. O kwuru na ihe na-akpata ọrịa utu nkụda dị ọtụtụ. Ha gụnyere: 1. Testosterone Nke a bụ akụrụngwa na-adị n'ahụ nwoke nke o ji enwe ike ịtụwa nwaanyị ime. N'aka nke ọzọ, akụrụngwa na-adị n'ahụ nwaanyị na-enyere ya aka ịtụrụ ime ka a na-akpọ 'estrogen'. Ọ bụrụ na akụrụngwa 'Testosterone' ezughị oke n'ahụ nwoke, ọ ga na-ewne utu nkụda. Dịka nwaanyị na-agbagote n'afọ, mmepụta 'estrogen' n'ahụ ya ga na-ebelata, mana ọ dịghị otu a n'ahụ nwoke. Naanị ọnọdụ ahụike dị aghaa nwere ike ime ka 'testosterone' gbadaa n'ahụ nwoke. Nka anaghị emetụta ya. 2. Mgbakasị ahụ maọbụ nchekasị (Stress) Nke a so n'otu ihe kacha akpata amụ nwoke anaghị ekeli ekeli. Ihe nwere ike ibute nchekasị dị ọtụtụ, dịka ụkọ ego, onye a chụrụ n'ọrụ, nsogbu ezinụlọ, dgz. Mgbe mmadụ nọ n'ọnọdụ nchekasị, ọbara anaghị aga n'ahụ ya dị ka o kwesịrị, nke a na-emetụta nkeli amụ nwoke. 3. Ọrịa Ọbara mgbalielu na Diabetes Dọkịta Abassi kwuru na ọbara mgbalielu bụkwa ihe ọzọ na-ebutere nwoke utu nkụda. O kwuru sị: ""Oge ọ bụla i lere etu ọbara gị ha, ọ bụrụ na akara nke dị n'elu karịa 120, maọbụ akara nke dị n'ala karịa 90 oge niile, mara na i nwere ọbara mgbalielu. ""N'ebe ndị isi ojii nọ, ihe kacha akpata ọbara mgbalielu bụ nnu, maọbụ ihe nwere ọtụtụ akụrụngwa 'sodium' n'ime ha."" ""Ọ bụrụ na i gaghị gwọọ ọbara mgbalielu, mara na amụ gị agaghị na-akwụ ọtọ etu o kwesịrị."" Gbasara diabetes, dkt Abassi kwuru na oke shuga n'ọbara mmadụ na-eme ka ọbara ghara ị na-erugharị etu o kwesịrị. Cheta na ọ bụ ọbara ịbanye n'ime amụ nwoke na-eme ka o kelie. Ọ bụrụ na ọbara anaghị erugharị nke ọma n'ahụ nwoke, gịnị ga-emezi ka amụ ya bilie? N'otu okwu, zeere oke shuga na oke nnu. 4. Anaghị emegharị ahụ Iji mee ka amụ nwoke na-aza oku oge niile, ọ dị mkpa ka nwoke na-eme 'exercise'. Nke a ga-enye aka ka ọbara na-agazi agazi n'ahụ nwoke, nke ga-eme ka odogwu ya gbasie ike. 5. Anaghị arahụ ụra etu o kwesịrị Ọ bụrụ na mmadụ anaghị arahụ ụra etu o kwesịrị ọ ga-eme ka ụbụrụ onye ahụ mepụta kemịkalụ a na-akpọ 'steroids'. 'Steroids' a bụ shuga nke nwere ike ime imetụta etu amụ nwoke si ekeli. Mmadụ kwesịrị ị na-arahụ ụra ihe dịka awa isii ruo awa asatọ na-enweghị nsogbu ọbụla. 6. Aramara dị mma ""'Exercise' nke m na-agwa ndị mmadụ ka ha na-eme oge niile bụ aramara dị mma."" ""Nnyocha egosila na ime aramara nke ọma na-ebulite ahụike nwoke,"" dọkịta Abassị kwuru. Ọ dị mma ka nwoke na-ewepu 'sperm' n'ahụ ya ihe ruru ugboro 21 kwa ọnwa. Nke a ga-enyekwara 'prostrate' ya aka gbochie ọrịa 'prostrate cancer' n'ọdịnihu. 7. Anaghị aṅụ ezigbo mmiri Dkt Abassi kwuru sị: ""Tupu afọ 2000, ọtụtụ ndị mmadụ na-aṅụ mmiri si n'aka gọọmentị nke nwere akụrụngwa dị icheiche na-edozi ahụ dịka 'flouride', 'calcium', na 'selenite'. Akụrụngwa ndị a na-enye aka ewulite 'sperm' nwoke, Mana ugbua, mmiri gọọmentị anaghị agbazi, ndị mmadụ anaghị enwetazi akụrụngwa ndị ahụ na mmiri. 8. Mmanya na-aba n'anya na ọgwụike Ọtụtụ ụmụ nwoke na-ekwu na ọ bụ naanị oge ha ṅụrụ mmanya maọbụ ṅụọ ogwụ ike ka ha na-akpa ike n'elu nwaanyị. Mana Dkt Abaasi kọwara na nke ahụ anaghị adịgide, kama ọ na-emebi ọtụtụ ihe n'ime ahụ. 9. Ịṅụ ọgwụ 'gbagagba' maọbụ 'ike agwụ nwa mkpi' Dkt Abaasi kwuru na ịṅụfe ọgwụ mgbọrọgwụ oke na-akpata ọtụtụ ọrịa dịka ọrịa akịrị, ọrịa umeji, na ndị ọzọ. Nke a bụ maka na onweghị onye ma ole mmadụ nwere ike ịṅụ ka ọ ghara ịṅụfe oke." https://www.bbc.com/igbo/58409360 +politics Exclusive Interview: 'Ndị ritere ọkwa gọvanọ n'ụlọikpe ma n'ime obi ha na ha abụghị gọvanọ' - Rochas Okorocha "Aka chiburu Imo Steeti, bụ Rochas Okorocha, gwara BBC Igbo ọtụtụ ihe banyere ihe na-eme na steeti ahụ ugbua nakwa etu o siri metụta ya. Rochas sị na ọ teela ndị mmadụ si ebe dị iche iche rụọwara ya ka ya pụta ịzọ ọchịchị onyeisiala maka ihe ọma ya megoro ha tupu ya abata ndọrọndọrọ ọchịchị. O kwuru na nke a bụ nke ugboro anọ ya ọ ga-apụta ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa maka na ọ dị ya mnwute na nnukwu obodo dị ka Naịjirịa bụ ihe ndị mmadụ jizi eme ""karịkaọchị"". Ọ sị na ""ọ bụ ihe mnwute na Naịjirịa adịghị n'otu. Ọ bụ ihe mnwute na ana egbuzi mmadụ ka ọkụkọ na Naịjirịa'. Ọ sị na ọ bụ ya mere ya jiri chọọ ịpụta maka ịzọ ya bụ ọkwa. Mana ugbua, na ya apụtabeghị maka nke a maka na ihe niile nwere usoro. Ọ sị na oge ruo na ya ga-apụta kwuo otu a. Geezia ọkpụrụkpụ okwu ndị ọzọ o kwuru." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59442697 +entertainment Lekki Toll Gate: A ga-enyocha ndị uweojii mekpara Mr Macaroni na ndị ọzọ ahụ "Onyeisi ndị uweojii na Legọs steeti, bụ Hakeem Odumosu, enyela iwu ka e nyochaa ndị uweojii mekpara ndị e jidere na ngagharịiwe Lekki Toll gate ahụ n'ụbọchị Satọde. Olumuyiwa Adejobi, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Sọnde, abalị iri na anọ nke ọnwa Febrụwarị. Cheta na ihe onyonyo pụtara na soshal media nke gosiri ụfọdụ n'ime ndị ahụ anwụchiri ebe ha nọ n'ime otu ụgbọala gbarachaa ahụ nkịtị. Hakeem Odumosu kwuru na ya enyela ikike ka e nyochaa ndị uweojii mere ihe ahụ ma taa ha ahụhụ kwesịrị ha. O kwuru sị: ""Ọ bụ eziokwu na ndị uweojii ga-agba mbọ ịhụ na ndị mmadụ mere ihe iwu kwuru, mana ha agaghị agbachị nkịtị ka ụfọdụ ndị otu ha na-emekpa ndị mmadụ ahụ n'ụzọ ekwesịghị ekwesị."" Odumosu gara n'ihu rịọ ndị bi na Legọs ka onye ọbụla na-agara mkpa ya ma zeere ihe ọbụla nwere ike ibute ọgbaaghara. Ka ndị uweojii tọghapụchara ya, Debo Adebayo, onye e ji Mr Macaroni mara ekwuola na e tiri ma gbaa ya na mnadụ 39 anwụchịkọrọ ya na ha ọtọ na Lekki Toll Gate ụnyahụ. O kwukwara na ọ chọbụghị ipụta n'ebe ahụ mbụ maka oke ụjọ ji ya mana mgbe ọ na-agafee hụ ka ịhe si kwụrụ, ọ ga-akwụnyere ndị ntoroọbịa iri atọ na itoolu ahụ pụtara ime ngaghariwe n'ebe ahụ. O kwuru ka ndị mmadụ jiri nwayọ makana gọọmenti etiti achọghị ịma onye bụ onye, ""ndị a ga-egbu onye ọbụla kwụchịrị ha ụzọ."" Lee okwu mbụ Mrmacaronii kwuru ka ndị uweojii tọghapụchara ya: Cheta na ndị uweojii tọhapụrụ Debo Adebayo, onye e ji Mr Macaroni mara, na mmadụ iri atọ na itoolu ndị ọzọ bụ ha nwụchiburu na ngagharịiwe e mere na Lekki Toll gate n'ụbọchị Satọde. Omoyele Sowore, onye nwe ụlọ ntaakụkọ Sahara Reporters, kwupụtara nke a n'akara Twitter ya. Onye ọzọ kwukwara na a kwụrụ otu narị puku naịra iji gbapụta Mr Macaroni. Ndị uweojii kwuru na ọ bụ maka na ndị ahụ na-eme ngagharịiwe dara iwu Covid-19 mere e ji nwuchie ha. Muyiwa Adejobi, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs, kwuru na ọ bụ ụlọikpe tọhapụrụ ndị ahụ ha jidere, ma kwukwaa na ha ga-abịakwa ọzọ n'ụlọikpe n'ụbọchị abụọ nke ọnwa March afọ 2021. Ọtụtụ ndị ama ama etinyela ọnụ katọọ aka ike ndị uweojii dịka ndị ntorobịa mere ngagharịiwe ọzọ na Lekki Toll Gate n'ụbọchị Satọde, abalị iri na atọ nke ọnwa Febrụwarị afọ 2021. Folarin Falana, onye oti egwu eji Falz mara, kwuru na ike Naịjirịa agwụla ya: Falz kwukwara na gọọmentị Naịjirịa egosila na ha achọghị udo chaachaa. Charles Oputa, onye e ji Charly Boy mara kwuru na Naịjirịa aghọọla ọgbọ ebe a na-egbu mmadụ. Osote Onyeisiala Naịjirịa n'oge gara aga bụ Abubakar Atiku kwuru na ihe ndịọrụ nchekwa kwesịrị ime bụ inye aka hụ na ndị na-eme ngagharịiwe mere ya n'udo. Atiku dọrọ aka na ntị ka onyeisiala Naịjirịa wepụ aka enwe n'ofe. Onye omeiwu bụ Shehu Sani kwukwara otu ihe ahụ Atiku kwuru. Amnesty International kpọrọ oku ka gọọmentị Naịjirịa chekwaa ndị na-eme ngagharịiwe na-emebighi ihe ọbụla. Otu onye na-eme ejije ụkaọchị bụ Debo Adebayo, onye e ji Mr. Macaroni mara, so na ndị a nwụchịrị n'ụtụtụ Satọde a na Lekki Toll Gate. A hụkwara ya na Twitter ebe ọ na akọwa ihe na-eme n'ime n'ihe onyonyo n'ime ụgbọala ""Black maria"" ebe ọ nọ. Onweghị onye hụrụ mgbe ejidere ya. Ihe ahụrụ bụzị ebe ọ nọ na Twitter na-eme ya bụ ihe onyonyo. Lee ihe onyonyo ọzọ gosiri ebe Mr Macaroni nọ n'ime ụgbọala ebe ndị uweojii debere ya na ndị ọzọ. Ọ kwụsịrị ya bụ ihe onyonyo ọ na-eme mgbe ndị uweojii napụrụ ya ekwentị ya. Onye ntaakụkọ BBC na-akọwa na agbanyeghị ihe karịrị mmadụ iri a nwụchịrị, na ụgbọala na-agbafekwa ebe ahụ were were. Otu nwoke nọ n'ime ""Black Maria ahụ na-eti mgbu na ya na-aga ụlọọrụ ya tupu aka akpara ya. Ọ na-ekwu na ọnweghị ihe ya mere. Ya bụ nwaadị na-ajụ ndị uweojii ""ọ bụ na m enweghị ikike ịgagharị n'ala m?"" Mana ọ nweghị onye tụpụụrụ ya ọnụ. Ya bụ nwaamadị na-ekwu na ọ bụ onye Njinia were ndị mmadụ n'ọrụ, mana ọnweghị onye ghere ya ọnụ. A chọpụtara na ahụ e sichaghị ụgbọala ndị uweojii ji buru ndị ahụ ike dịka akwawara ya aka mana ọ nweghị ike ịnupu. E mechere kpọrọ ndị ahụ banye n'ụgbọala ọzọ were pụwa. Nwaandị sị na aha ya bụ Christopher Udoji bụ ọnye nwetere onwe ya na ụgbọala ndị uweojii ahụ sị na ya na-agafe agafe tupu anwuchie ya. Ụfọdụ ndị anwụchịrkwara kwetakwara na n'ezie, ha pụtara ya bụ ngagharịiwe. Ndị uweojii na ndị agha Naịjria wuchiri n'uju na Lekki Toll Gate ebe ndị ntorobịa siri ọnwụ na ha ga-amaliteri ngagharịwe taa bụ Satụde. Ndị ọrụ BBC nọ ebe ahụ kemgbe elekere isii nke ụtụtụ ịwetere unu ka ịhe sị aga. BBC hụrụ ọtụtụ ndị uweojii na ndị agha Naịjriịa ka ha kposara ebe ahụ. Ha hụkwara ụfọdụ umu ntorobịa pụtara ebe ahụ, ụfọdụ n'ime ha ka anwụchiri tụba n'ụgbọala ndị ụweojii buru pụọ. Dịka ndị BBC nọ ebe ahụ siri kwuo, ""ndị uweoji nwuchiri ụfọdụ ndị pụtara ebe ahụ"". Otu onye okoroobịa a nwụchiri kwuru na ya bịara nleta ihe na-eme na-ebe ahụ, mana ndị uweojii nwụrụ ya tinye a n'ụgbọala Bekee kpọrọ ""Black Maria"". Cheta na-ana atụ anya na ndị ntoroọbịa ga-apụta taa maka ngagharịiwe atụmatụ ọgbakọ na-enyocha mmegide ndị uweojii ka enyeghachie ụlọ ọrụ ""Lekki Concession Company"" (LCC) ogige Toll Gate ahụ ka ha malite tụwa mgbere n'ebe ahụ.Ọ bụ na Lekki Toll Gate ahụ ka anọ mee ngagharịiwe n'Ọktoba 2020 butere ebubo na egburu ndị mmadụ. Ọ bụ ebubo ogbugbu mmadụ butere ngagharịiwe a dịka ụfọdụ mmadụ na-ekwu na ya bụrụ na-afụghị isi ogbugbu ha, ekwesighi imepe ya bụ Toll Gate. Otu onye anwụchịrị ebe ahụ na-akọwa na ọ bụ ya bụ ngagharịiwe ka ya pụtara tupu ndị uweojii akpara ya aka. Ụfọdụ ndị ụmụntorobịa ahụ anwụchịrị ekweghị ekwe o, dịka ha ka na-aba mba na ha nwereikike ịpụta mee ngagharịiwe n'udo. Onye ntaakụkọ BBC na-ekwu na amaghị ihe ọtụtụ so na ndị anwụchịri mere ndị uweojii ji kpara ha aka. Ọ kwuru na ha anwuchiela ihe karịrị mmadụ iri ebe ahụ n'ụtụtụ a. Ọtụtụ ndị ọzọ jukwara ebe ahụ bụkwa ndị ntaakụkọ sị ụlọọrụ ntaakụkọ dị ichie iche." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56052328 +health Coronavirus Test: Ihe a ga-eme iji wulite nyocha maka coronavirus n'ala Igbo "Ụnyahụ bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa June ka onyeisi Nigeria Centre For Disease Control bụ Chikwe Ihekweazu kwuru na o nweghị ka ndị bi n'ala Igbo ghara inwe mgbalite ọnụọgụgụ ndị bu coronavirus maọbụrụ na-eme nyocha zuruoke. O kwuru na nke a bụ maka na ndị Igbo bụ ndị na-emekarị njem. Mana gịnị na-akpata emeghị nnyocha zuruoke maka covid-19 n'ọwụwa anyanwu? Dkta Mcginger Ibeneme bụ , onyeisi 'Isolation Centre, Nnamdi Azikiwe Teaching Hospital, Nnewi, kwuru na o kwetaran'ihe onyeisi NCDC kwuru. O kwuru na ọtụtụ ndị na-akpọ ụlọọrụ NCDC na-agwa ha na ha na-ahụ ihe na-egosi na ha ebutela ọrịa ahụ, mana ụfọdụ oge ha kpọọ ụlọọrụ NCDC nke steeti o nweghị onye ga-atụpụrụ ha ọnụ. ""A naghị agadị eme ha nnyocha."" O kwuru na steeti dịka Ebonyi na-enyocha mmadụ ruru 100 kwa ụbọchị makana ha nwere ebe nyocha na steeti. Ihe a ga-eme iji wulite nnyocha maka covid-19 na mpaghara Ọwụwa Anyanwu Mcginger kwuru na: Mbọ niile anyị gbara ịnụta n'ọnụ ndị kọmịshọna ahụike steeti ndị dị na mpaghara ọwụwa anyanwu kpụrụ n'ala makana ha azaghị ekwenti ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52953382 +business 250 Account Probe: Gọọmentị Imo na-akpa agwa ụmụaka ọtaakara - Rochas Okorocha Ndị ụlọomeiwu Imo steeti enyela ikike ka enyocha akara ọba ego narị abụọ na iri ise emepere mgbe Rochas Okorocha bụ Gọvanọ Imo steeti. N'aka nke ọzọ, lekwa ihe Rochas Okorocha nwere ikwu maka nyocha Gọọmenti Imo steeti na-enyocha ya. Onyeomeiwu Imo steeti bụ Uche Ogbuagu kwuru na nyocha a bụ ka achịkọtaa ọba akụ ndị a ka ha bụrụ otu. Ihe nke a pụtara bụ na ha ga enyocha ọba ego ndia niile ka ha mara nke ego dị ma nke ego na adịghi. Ogbuagu kwuru na mgbe ha mechara ka ha ga-achịkọta ọba ego ndị a n'ihe ndị bekee na-akpọ 'Single Treasury account'. Ndị omeiwu a rịọrọ ka ndị Ụlọakụ nwe oba egoi ndị a nyere aka ka atụmatụ a gaa nke ọma. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50142431 +health Tuberculosis, akpụka nti, ụkwara nta na ọrịa ndị ọzọ ị nwereike ikute n'ume Dịka mbaụwa niile na-echeta ụbọchị Tuberculosis - Ụkwara nta taata, makwa na-ebuso agha megide ọrịa coronavirus ugbua, e nwere ọrịa ndị ọzọ a na-esi n'ikuku ebute mama ọtụtụ amaghị maka ha. Akụko a ga-arụtụ aka n'ụfọdụ ọrịa ndị a nakwa njirimara ha. 1 - Ụkwara nta Ụkwara nta nke bekee na-akpọ Tuberclosis bụ nje Bacteria na-ebute. Ọ bụ mgbe onye bụ ọrịa a kwọrọ ukwara maọbụ maa uzere ka ndị ọzọ nwereike ibute ya. BBC dere na ọ siri ike ibute ọrịa ụkwaranta kama ọ bụrụ na onye bu ya anataghi ọgwụgwo, ọ na-egbukarị onye ahụ. Ọrịa ụkwaranta kacha emetụta ngụ mmadụ, kama ọ na-emetụta kwa ọkpụkpụ mmadụ, afọ na eriri nsiụbụrụ. Njirimara ọrịa ụkwara nta 2 - Azụzụ Okenye nwereike ibute azụzụ ugboro anọ n'otu afọ. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ nje sị n'ezinaụlọ nje asaa nke gụnyere nke Rhinoviruses, so na-ebute ọrịa azụzụ. Nje ndị a ruru otu narị na iri isii n'ọnụ ọgụgụ ma nwe kwa ike ịgbanwe onwe ha maọbụ zọọ n'ime ahụ mmadụ nke na-eme ka o sie ike igbu ha. Dịka ọ dị ugbu a, ndị ọrụ sayensị chebere ihu ha ịhụ na nje azụzụ enweghị ike ịkpa ike n'ahụ mmadụ kama enweghị ọgwụ eji agwọ ọrịa azụzụ. Njirimara ọrịa Azụzụ Dịka ndị BBCPidgin siri dee, lee ihe e ji mara ọrịa azụzụ 3 - Okponọha Ọrịa okponọha bụ ọrịa ọzọ sị n'ikuku efesa nke dị Bekee na-akpọ Influenza. Ọ bụ nje Virus na-ebute ya. Ọrịa a na-agbanwe onwe ya nke mekwara ka ọgwụgwọ ya sie ike. Okponọha gburu ihe ruru mmadụ otu nde narị site n'afọ 1918 ruo 1920, ọ na-akacha njọ n'oge udu mmiri. Njirimara ọrịa okponọha 4 - Kịtịkpa Kịtịkpa bụ ọrịa nje vịrụs na-ebute. A na-akpọ ya Chickenpox na Bekee. E nwere ọgwụ mgbochi a na-agba ụmụaka maka ya site n'otu afọ ruo afọ iri na abụo. Ọ bụ site n'ụkwara na uzere ka e nwereike iji butee maọbụ kesaa ya. Njirimara ọrịa Kịtịkpa Dịka e siri dee, njirimara Kitikpa bụ A hapụ ya, o nwereike imetụta ụbụrụ maọbụ bute oyi ọtụtu nke nwereike ibute ọnwụ. 5 - Akpụka nti Ọrịa akpụka ntị bụkwa ọrịa ọzọ na-efesa n'ikuku nke ọ bụ nje na-ebute ya. Dịka ndị BBC siri dee na ọrịa akpụka nti na-efesa etu ọrịa azụzụ na ndị ọzọ sị efesa nke gosiri na asụ pụtara n'ọnụ onye nwere akpụka ntị banye n'ọnụ onye ọzọ ga ebunye onye ahụ ya bụ ọrịa. Enwere ọgwụ mgbochi eji maka ya bụ ọrịa. Njirimara ọrịa akpụkanti 6 - Arụbara Arụbara bụ ọrịa na-esite na nje virus awakpo ndị mmadụ. BBC dere na ọ bụ site na asụ mmiri sị n'ụkwara, uzere ma mmetụta. Nje arụbara nwereike ị nọ n'ikuku ọtụtụ awa. Ọrị a na-enye ụmụaka nsogbu karịa mana ọ na-emekwa ndị okenye ahụ ha esighịike iluso nje ọgụ. Arubara nwereike ibute ọrịa ndị dịka ọrịa ntị, akwụkwụ, afọ ọsịsa, oyi ma nwereike imetụta ụbụrụ. Njirimara ọrịa Arụbara 7 - Ụkwara tịkotịkọ Nke a bụ ọrịa sitere na nje Bacteria. Ọ na-esikwa n'ikuku ekesa site n'asụ maọbu ụkwara. Mgbe mmadụ si n'imi kuru ihe nje a ka ọ na-enute ọrịa ụkwara nta. Ọ kacha eme ma na-egbu kwa ụmụaka mana enwere ọgwụ mgbochi maka ya bụ ọrịa. Njirimara ọrịa ụkwara tịkotịkọ Ndị BBC dere na njirimara ọrịa dị ka nke azụzụ 8 - Covid-19 Ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) nọọrọ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Julaị na-ekwu na ọrịa coronavirus nwereike isite n'ikuku efesa. Nke a bịara dịka ndị Sayensị ruru narị abụọ boro WHO ebubo na ha ejighi nyocha sị na ọrịa coronavirus nwereike isite n'ikuku efesa kpọrọ ihe. Mana WHO mechara kwete na nyocha a ma kwuo na ọrịa covid-19 nwereike isi n'ikuku efesa ọkachasị ebe igwe mmadụ nọ n'ogige ikuku adịghị. Kama ha sị na ha ka na-eme nyocha ha. Njirimara ọrịa Covid-19 Lee njirimara ọrịa dịka ndị BBC siri dee bụ https://www.bbc.com/igbo/afirika-53335806 +politics 2019 Election: Ndị ndọrọndọrọ anọghị n'ọchịchị chọrọ ibute ọgbaghara na ntụliaka - Lai Mohammed Akụkọ dị mkpa Onye minista na-ahụ maka mgbasa ozi na omenala bụ Lai Mohammed, e kpugheela ihe ọkawara dịka nkata ọjọọ ndị ndọrọndọrọ na-anọghị n'ọchịchị na-akpa iji kụnyere ntụliaka nke ọnwa Febụwarị 2019 ụkwụ. N'ozi o zipụrụ ụbọchị Monde, Mohammed kwuru na ọchịchị etiti enwetala ozi na ndị a na-anọghị n'ọchịchị chọrọ ibute ọgbaghara iji kposaa ntụliaka ahụ na-abịa abịa, ma nye ohere ka enwee ọchịchị nchere oge. O kwuru na ha enwetakwala ozi na ndị a akpọtụrụla otu Boko Haram, ndị ojiegbe ezu nakwa ndị agha egoro ego si mba Niger, iji buo agha megide ndị nọ na ọchịchị, nakwa steeti dị iche iche gụnyere Adamawa, Bauchi, Borno, Benue, Kano, Kaduna, Nassarawa, Plateau, Taraba nakwa steeti Zamfara. Onye Minista a nyere mmasịobi ike na ọchịchị etiti na-agbasi mbọ ike iji kụgharịa ajọ ọnọdụ a, ma mee ka enwee ntụliaka nke afọ 2019 bụ ịgba. Ọ rịọziri ndị Naijiria ka ha mụrụ anya ka azụ na ụbọchị ndị na-abịa abịa, ma gbakwụnye na ụlọọrụ ndị nọ n'okpuru ụlọọrụ ya ga-arụ ọrụ iji hụ na-agwara ndị Naijiria ka o si akpọtụ gbasara ntụliaka na-abịa. Ọ bụ onye bụbụ onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasajo na mkparịta ụka ya na BBC nwere sị onye ọbụla nwere ike izugbu Naijirịa n'ohi ma ọ nweghị ihe a ga-eme ya ma ị nọrọ na pati APC. Chebiri akụkọ a n'uju na elekere isii ụtụtụ echi. Ọnụ na-ekwuru gọọmenti etiti bụ Laị Mohammed oboro ndị pati na anọghị n'ọchịchị ebubo mgbaokpuru maka ịbute ọgbaaghara na ntuilaka 2019. N'ofesi, Ọba nzikọrịta ozi Whatsapp ekpebiela ịbelata mmadụ ole ị nwere ike ịgbasara ozi otu mgbe dịka onyeisi ha siri kwuo na Jakarta, Indonesia. Ụlọọrụ a mere nke a iji belata akụkọ ụgha eji ya bụ ọba nzizọrịta ozi agbasa bụ nke eboro na ọ tara isi mmadụ ole ma ole mgbe gara aga. N'egwuruegwu, akuko na-eru anyi ntị sị na atụrụ ụmụnwaanne atọ si ezinaụlọ Sodje eji egwuruegwu mara mkpọrọ maka ịkpabiri ego n'akpa ego ụlọọrụ ha guzobere iji enyere ndị ụwa na-ara ahụ aka. Atụrụ ụmụ Naịjirịa a bụ Efe, Stephen na Bright Sodje mkpọrọ kemgbe afọ 2017, mana ọ bụ ugbua ka iwu kwere ka agbasaa ozi ya. Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na onyeisi ndị uweojii ọhụrụ bụ Adamu Abubakar enyela iwu ka e kpochapụ ngalaba ndị uweojii a na-akpọ F-SARS n'ịchafụ. Onye na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari ọnụ n'ihe gbasara soshal midia bụ Bashir Ahmad depụara nke a n'akara Twitter ya. Mana, BBC Hausa na-akọwa na mkpochapụ metụtara sọsọ ebe ọrụ F-SARS dịka ngalaba dị n'aka gọọmentị Naịjirịa. Ihe atumatu a pụtara bu na F-SARS alagachiela ịbụ SARS, ma ị nọkwa n'okpuru aka na-achi ndi uweojii na steeti dị iche iche. Gọọmentị Muhammadu Buhari asaala onye bụbụ onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo. N'ọsịsa ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garba Shehu binyere aka, gọọmentị etiti sị na Obasanjo na-eme anya ụfụfụ makana Buahri ka nwe ugwu. Ha gara n'ihu kwuo na eziokwu adịghị n'ebubo niile Obasanjo boro Buhari na APC banyere ntuliaka n'abịa. Ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ndị nkụzị mahadum bụ ASUU enyela gọọmentị etiti atụmatụ ha ga-eji laghachi ọrụ. Biodun Ogunyemi bụ onyeisi ASUU sị na ha ga-akagbu abụbụ ọrụ bidoro kamgbe afọ 2018 ma ọ bụrụ na gọọmentị kwụọ ha ijeri naira narị abụọ na iri abụọ (220 billion). Aka uweojii ji ndị na-ere nri nwa Ndị uweojii na mba Australia awụchiela mmadụ ise ha sị aka ha dị na nrụrụaka metutara ire nri nwa na China. Nrị nwa kwa? Eziokwu, China bụ mba ebe ntụbata nrị nwa bụ ahịa ukwu na-enye ego. Nke a bụ maka ujo nri nwa adigboroja. Rangers agaala ihu n'iko CAF Otu Rangers International nke Enugwu jị ọkpụ goolu abụọ asatara otu sị Bantu FC nke mba Lesotho gaa nke ọma n'asọmpị CAF Confedration cup Mmeri a nyere Rangers ohere ịga n'ihụ na-agba ọzo n'asọmpi a. Gee nkeji a ebe a: Lee ihe nkiri nke taa: https://www.bbc.com/igbo/afirika-46930650 +business Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: Naịjirịa ga-abụ ọka ibe na mmanụ gasị - NLNG Akụkọ ndị dị mkpa Ụlọọrụ na-esi mmanụ gasị bụ NLNG n'ịchafụ ekwuola na ọ bụrụ na mkpebi ntinye ego ọhụrụ ha nweisi n'ọnwa Disemba, na ọ ga-eme Naịjirịa mba nke atọ Kachasị n'ibupụ mmanụ gasị n'ụwa niile. Ebe Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ na Naịjirịa bụ Ibe kachukwu ekwuola ma ntuliaka afọ 2019 agaghị egbochi atụmatụ ọma ụlọọrụ ahụ nwere. Otu jikọtara ụmụIgbo nọ na mba ofesi bụ World Igbo Congress agbarụọla ihu ma katọọ gọọmentị na-achị naịjirịa ugbua kwuo na ha ji ndị ọrụ nchekwa ebuso ndị na-ama ha aka n'ihu agha. Ozi a si n'akwụkwọ onyeisi oche ha bụ ọkanmụta Anthony Ejiofor n'ọgbakọ ha mere n'ọgbakọ ha mere na mba Amerịka. Ọrịa ebola ka na-aga n'ihu n'iwakpo ndị mba D.R Congo dịka nke malitere ọhụrụ a gburula mmadụ karịrị iri atọ. Otu ahụike n'ụwa bụ World Health Organisation kwuru na nke a nwereike iraahụ n'ịchikọta. N'egwuregwu, Akwa daara n'Enugwu n'isi ụtụtụ ụnyaahụ mgbe otu onye nkuzi otu egwuregwu bọọlụ Lamray United bụ Sunny Supremo Chukwu si n'ụra fee n'ọnwụ. Akụkọ kwuru na o mere mkpesa gbasara obi mgbu tupu ọ na-ehi ụra n'abalị ahụ. Ihe nkiri nke taa; https://www.bbc.com/igbo/afirika-45074412 +politics Bola Tinubu: Onye bụdị 'Agụ Bourdillon’ meriri na ntuliaka imeụlọ APC? Aka chịburu Legọs steeti bụ Bola Ahmed Tinubu emeriela ntuliaka imeụlọ ndị otu patị 'All Progressive Congress'(APC) dịka a kpọpụtara aha ya taa bụ abalị asatọ nke ọnwa Juun afọ 2022. Tinubu ji vootu 1271 n'ime 2230 ( nke karịrị pasent iri ise vootu a tụrụ) were merie Minista njem bụ Rotimi Amaechi bụ onye nwetara vootu 316, ebe Osote Onyeisiala bụ Yemi Osinbajo, nwetara vootu 235. Ndi ọzọ ha na Tinubu zọrọ ya gụnyere Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu bụ Sen Ahmed Lawan bụ onye nwetara vootu 152; Gọv Yahaya Bello nke Kogi steeti nwetara vootu 47,Gọv Dave Umahi nke Ebonyi steeti nwetara vootu 38; Gọv Ben Ayade nke Akwa-Ibom nwetara vootu 37,Senator Ahmed Sani nwetara voootu anọ; Ogbonnaya Onu nwetara otu 1; ebe Emeka Nwajiuba bụ Mịnịsta nta na-ahụ maka agụmakwụkwọ nwetara otu vootu; Pastọ Tunde Bakare, Rochas Okorocha, Jack Rich na Ikeobasi Mokelu enwetaghị vootu ọbụla ma ncha. Okwu mmeri o kwuru ka a kpọpụtachara aha ya, Tinubu kwuru na ya atụghị anya na ya ga-emeri. O kelere ndị wepụrụ onwe ha n'ụsọ iyi nye ya ohere dịka Badaru Abubakar, Seun Ajayi , Dimeji Bankole, Godswill Akpabio, Kayode Fayemi, na Uju Kennedy. Ọ katọrọ ịkwọ aka ọbara n'ihi okpukperechi, ma kpọọ oku ka onye ọbụla gbaso ịhụnaya ma wezụga tigbu-zogbuo. Lee ihe ndị ị maghị maka Tinubu https://www.bbc.com/igbo/articles/c80kej5nydko +entertainment Poco Lee: Etu m si bụrụ ọgbaegwu a ma ama nakwa ihe na-enye m ọṅụ Iweh Pascal Odinaka a ma dịka Poco Lee, ekwuola etu o si bụrụ onye a ma ugbua dịka onye obi ọma. Ya bụ ọgbaegwu a ma ama na Naịjiria, gwara BBC na ọ bụ Chineke mere ka ọ bụrụ onye obi ọma n'agbanyeghi ụdịrị ahụhụ ọ tarala n'ụwa. Ọ kọwara etu o si malite ịgba egwu nakwa etu o si malite iji ya akpata ego oge ọ bụ nwatakịrị. Ọ kọwara na ịgba egwu gbanwere ndụ ya n'ụzọ pụrụ iche. Ihe ndị ọzọ ọ gwara BBC na mkparịtaụka a gụnyere onye ọ gaara abụ ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọgbaegwu. Ọ gakwara n'ihu dụọ ndị ntorobịa na-apụta ịtụ vootu na ntuliaka e ji ahọpụta onyeisiala Naịjiria n'afọ 2023 ọdụ. Gere nke a na ihe ndị ọzọ o kwuru n'uju ebe a: https://www.bbc.com/igbo/articles/czrnmmmlp97o +health Cronavirus: Lee mba ndị COVID-19 echetabeghi Ọrịa coronavirus nke a na-akpọ COVID-19 na-eme njem na-agagharị mbaụwa dị icheiche mana ị ma na e nwere ebe ndị ọ tụbeghị ụkwụ ruo ugbua? Ọrịa a batara Naịjiria n'ime izu ole na ole gara aga, egbuola ihe karịrị mmadụ puku 50 kemgbe o selitere isi na mba Chaịna n'ọnwa Jenụwarị 2020. Ka ọ dị ugbua, ihe ruru mmadụ otu nde ebutela ya bụ ọrịa na mbaụwa, ebe ihe karịrị mmadụ puku narị abụọ gbakerela. Mana ị makwa nke ekwe na-akụ nwanne? Ruo taa bụ abalị atọ nke ọnwa Eprelụ, e nwere mba ndị ejibeghi anya hụ kama otu onye bu ọrịa a. Ị na-ajụ mba ndị ọ bụ? Ngwa lee ka anyị kọwaara gị: Dịka BBC si chọpụta na ngụkọ mahadum Johns Hopkins mere, mba 18 n'ime mba 193 so n'otu mbaụwa bụ United Nations enwebeghi otu mkpụrụ onye bu ya bụ ọrịa. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-akọwa na o nwereike ịbụ na mba ndị a akpọpụtabeghi ọnụọgụgụ ndị bu ya; na ọ bụghị na enwebeghi ndị butere ya. Ndị ọzọ, ọkachasị ndị a bụ mba ndị nọ n'elu mmiri a na-akpọ aịlandị, nwereike ha ebutebeghi ya n'ihi na ha anaghị enwekarị ndị si esi abata mba ha (bụ etu ọtụtụ ndị mba ọrịa a na-enye nsogbu ugbua a si bute ya). Ụfọdụ mba ndị ahụ tere ezigbo aka nke bụ na mmadụ ga-eme oke njem tupu o rute ebe ahụ. Ihe dịka mba Nauru, machiri mba Chaịna, Saụt Koriya, Itali na Ịran ịbata na mba ha ka ọrịa a malitere. Ha kwụsịkwara ụfodụ ụgbọelu si mba ndị ọzọ ifetu na mba ha, dịka onyeisiala mba ha sịkwa na o ji ekpere na akwụkwọ nsọ echekwa mba ya. Ndị ọkachamara na-ekwu na mmachi na mgbochi ha na-eme nwereike na-azọ ha ugbua, mana o nwereike ghara ịdịgịde. Maka gịnị? Andy Tatem, bụ ọkammụta sayensị na mahadum Southampton, kwuru na mba ndị a na-atụbatakwa ihe dịka nri na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka. Nke bụ na e gbochigide, oge ga-erukwa mgbe ha ga-achọ ịtụbata nri maọbụ ihe ndị ahụ maọbụ ibupu nke si mba ha. Mgbe ahụ ha ga-emepe okeala ha makwa bulie ụfọdụ mmachi a nke ga-eme ka ọrịa a nwee ohere ịmịbata. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-52158515 +entertainment Etu e si chọta ozu otiegwu Chop Boii na ndị enyi ya atọ n'Abuja Akụkọ ọhụrụ apụtala maka ọnwụ Anpe Pankyes Samson, bụ otiegwu a ma dịka Chop Boii na Naịjiria, onye a hụrụ ozu ya na ndị enyi ya atọ n'ime ụlọ na Gwarimpa dị n'Abuja nso nso a. A chọtara ozu Chop Boii bụ onye si Plateau steeti, onye mmepụta egwu ya a ma dịka Beerollings, enyi nwaanyị Beerollings na otu nwoke ọzọ, n'ime ụlọ ahụ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Septemba 2022. Dịka akụkọ si kwuo, enyi nwaanyị Chop Boii malitere ịchọ ya ka ọ na-anụghị olu ya ka otu ụbọchị gachara, ese ọ jụwara ndị enyi ya ka o ji mara na ọ bụ otu enyi ya ọzọ ka a ma na ha abụọ nọ mgbe ikpeazụ anya hụrụ ya. Enyi ya nwaanyị ahụ kpọrọ ndị uweojii; ndị du ya gaa n'ụlọ enyi ya nwoke ahụ (onye nke atọ a hụrụ ozu ya) ebe a nọ wee hụ na ndị amabeghi ndị ha bụ egbukasịala mmadụ anọ ahụ nọ n'ụlọ ahụ. Ka ọ dị ugbua, ebugala ozu ha n'ụlọozu dị nke Kubwa General Hospital. Ndị uweojii amalitela ime nnyocha ịma etu ihe si gaa. Akụkọ ka na-abịa. https://www.bbc.com/igbo/articles/cp94epnxvxpo +business Tax Identification Number: I nwetela nke gị? "Tupu ị nwee ike ịdọrọ ego n'ọba ego gị bido n'ọnwa Jenụwarị 2020 gawa, ị ga-egosi na ị na-akwụ ụtụisi gi. Nke a bụ nke na-efegharị na soshal midia ma na-ekwukwa na atụmaatụ a so n'akwụkwọ ndị ụlọomeiwu ukwu wepụtara n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa November, 2019. BBC Igbo gbalịrị ịnụta n'ọnụ ndị ọrụ ngalaba mmefu na mkpata ego Naịjirịa bụ ""Ministry of Finance, Budget and National Planning"" gbasara ya bụ atụmaatụ mana ọ mịtaghị mkpụrụ. Anyị gakwara n'akara twitter ha ma chọpụta na ya bụ iwu gafere ogo nke ngụpụta atọ, na-echezi ka onyeisiala binye aka na ya. Mgbe BBC Igbo jụrụ ndị ụlọ ọrụ 'Federal Inland Revenue Service,' otu onye na-anọ n'oche nnabata ha gwara anyị na ya bụ atụmaatụ erubeghị ha ntị. Anyị jụkwara ọnụ na-ekwuru ndị ụlọakụ Fidelity bụ Ejike Ndiulo maka ya bụ atụmaatụ, o kwuru na ozi ahụ erubeghi ha ntị. Nke a bụ akara ndị ụlọọrụ ụtụisi na-enye mmadụ maọbụ ụlọahịa nke ga-abụzi njirimara ha mgbe ọbụla ha chọrọ ịkwụ ụgwọ ụtụisi. - I ga-enweriri akara Bank Verification Number(BVN) nakwa akwụkwo njirimara nke mba Naịjirịa. - Ihe mere i ga-eji nweriri akara TIN bụ maka iji gosi na ịbụ nwafọ Naijirịa maọbụ ụlọahịa na-akwụ ụgwọ ụtụisi. - A naghị akwụ ụgwọ maka idebanye aha iji nweta TIN mana ọ bụrụ na ị si n'aka ndị ọsọ ahịa, ọ ga-eme ka ịkwụọ ụgwọ. - A na-eweta ya ozigbo imechara usoro eji enweta ya mana ụfọdụ oge o na-ewe ihe ruru abalị abụọ iji pụta. Ihe ndị a bụ dịka ụlọọrụ Joint Tax Board si depụta n'akara webụsaịtị ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50619970 +business Coscharis Group: Etu N200 jiri gbanwe bụrụ ide ego n'aka m "Onye ojiego achụa ego a ma ama bụ Cosmas Maduka onye e ji Coscharis mara, kọwara etu o siri bụrụ ide ego na mkparịta ụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Tọọzde, abalị iri na itoolu nke ọnwa Sepụtemba afọ 2019. Maazị Maduka sị na ya bidoro njem ịchụ ego ya n'ịgba bọị, tupu nna ya ukwu eji narị naịra abuo duo ya n'afọ 1976. Lee etu o siri gbarie njem ya: Maduka kọwakwara etu o si malite njem azụmahịa ya wee ruo n'ogogo ọ nọ ugbua. Ọ kọwara na ""Coscharis"" bụ nchịkọta aha ya na nwunye ya bụ Cosmas na Charity. Ọ kwụsịrị agụmakwụkwọ n'elementarị nke atọ ma bido ịmụ ahịa n'aka nna ya ukwu bụ onye ji naanị N200 dụọ ya ụlọ n'afọ 1976. Ọ bụ ahịa akụrụmgwa ọgbatumtum ka o jiri bido. 1) Ndụmọdụ na nkwado Nne ya ""Agụụ chineke mere ka m hara igahe ụzọ."" Cosmas Maduka Nne ya bụ ezigbote onye na-ekpere chineke, ọ gwara ya ka ọ nwee okwukwe na Chineke nakwa n'ime onwe ya. Nne ya kuziri ya etu e si ekpe ekpere ma nye ya ndụmọdụ etu o ga-esi bie ezigbo ndụ. Mama Madụka mere ka ọ nwee ezigbo olileanya na okwukwe na ihe ga-agaziri ya. Madụka sị na onweghi ike iwepụ anya n'ebe Chineke nọ. ""Onweghị ihe dịka ihu ụzo (Vision) ọ ga enyere gị aka imata ihe i ga-eji ndụ gị mee."" Cosmas Maduka Mazi Cosmas Maduka rịọrọ ndị ntoroọbịa ka ha bido n'oge chụwa ewu ojii. Madụka kwuru na onweghị ihe o mere ma mmadụ bido n'afọ iri na abụọ nwee ihe ọ na-atuanya n'ime ndụ ya. o kwuru na ihe niile abụghị ihe ndapụta maka na e nwere iwu na-ahazị ihe n'ụwa. Mazi Madụka kwuru na mgbe ọ dị afọ iri na isii, ọ marala ihe ọ chọrọ ibụ. Ọ dekwara n'akwụkwọ na tupu ọ ruo afọ iri abụọ na atọ na ọ ga-ego ụgbọala nke ya. Ọ sị na o mezuru nke a ka o si dee ya. Ọ gwara BBCIgbo na ihe mmadụ na-eme taa ga-egosi ihe ọ ga-abụ na mgbe na-adịghị anya. Onye ọ bụla kwesiri inwe onye ga-edu ya ma soro nzọ ụkwụ onye ahụ. O kwuru na ọ bụ mgbe ọ gbara nna ya ukwu ""Boy boy"", ka ọ chịkwara onwe ya ma soro ezigbo nzụ ụkwụ dịka nwata. "" Ego 'dot.com' ga efukwa ka 'dot.gone' "" Cosmas Madụka Cosmas Maduka gwara BBC na ebe ọbụla mmadụ chọro i ga n'ụwa a, ọ gbado anya ọ ga-erute ya. Mana ọ dị kwa mkpa ka onye ahụ kwụwa aka ya ọtọ. Ọ sị na ọ bụ ndị Japan mepere ya ụzọ n'ahia. O kwuru na ọ bụ ikwụwa aka ya ọtọ mere ka ndị ụlọọrụ Japan tukwasị obi n'ebe ọ nọ ma mepere ya ụzọ. Maduka kwukwara na ọ bụ ezi omume a mere ka ụlọọrụ ya bụ Coscharis ji na-anọchite anya ụlọọrụ dịka Jagua, Rolls Royce, Range Rover na Ford na Naịjirịa. ""Ndi enweghị ebe ha na-aga ga-achọ ka gị na ha nọrọ n'otu ebe."" Cosmas Maduka Ọ naghị ele ihe onyonyo, kama ọ ga-ele ihe onyonyo ya gụọ akwụkwọ. Enweghị ihe onyonyo mekwara ka ya na nwunye nwee ezigbo mmekọrịta. Ọ bụ akwụkwo mgbasa ozi ka o ji amata ihe na-eme. Mazi Madụka na-eri ezigbote nrị na-edozi ahụ. Mazi Maduka nwere ala rụrụ oke ala 3,000Ha ebe ọ kọrọ osịkapa n'Anambra steeti. Kama ọ bụ naani 1,200Ha ka ha na-akọ ugbua. Ọ kwuru na Naijirịa na-emefu Ijeri naịra atọ n'ibubata osikapa, na ọ chọrọ inweta pasentị iri abụọ na ise (25%) n'ime ego a. Ọ ka na arụ ya, mgbe ọ rụchara ọ ga-enye ndị mmadu ruru 3,000 ọrụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49751952 +politics Okechukwu Okoye: Akụkọ ọnwụ Okechukwu Okoye ga-agbawa Nnamdi Kanu obi ma ọ nụ ya - Ifeanyi Ejiofor "Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor, bụ onye na-anọchite anya Mazi Nnamdi Kanu, akatọọla ogbugbu e gburu onye omeiwu Okechukwu Okoye. Ejiofor kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi o wepụtara taa bụ ụka, ma kwukwaa na ogbugbu ya ga-ewute Nnamdi Kanu nke ukwuu ma ọ nụ ya. Cheta na e gburu Okechukwu Okoye, bụ onye na-anọchite anya mpaghara Aguata II n'ụlọomeiwu Anambra steeti, ma gbupụ ya isi. ""Mmụọ ọjọọ na-aṅụ ọbara ewerela ọnọdụ n'ala anyị...nke anyị agaghị ekwe ka ọ gaa n'ihu,""Ejiofor kwuru. ""Ama m na akụkọ a ga-agbawa onye ndu Nnamdi Kanu, bụ onye m na-anọchite anya ya, obi, n'ihi na ọ gwala m ugboro ugboro ka m dọọ aka na ntị ka ndị na-eme arụ ndị a niile kwụsị."" ""N'ezie, ndị iro anyị ewerela ọnọdụ n'obodo anyị na-emezi ihe masịrị ha."" ""Anyị na-akpọku ndị niile ọnụ na-eru n'okwu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ka ha jikọta aka ọnụ, ma tụkọta alo anyị ga-eji nwụchie ndị na-akpa arụ a na be anyị."" Ejiofor kwuru na o doro ya anya na ndị ekperima a na-eyi ndị mmadụ egwu abụghị ndị na-achọ nnwereonwe Biafra, kama ha bụ ndị ọrụ ngo nkr ọrụ ha bụ imebi aha ndị otu IPOB. ""Anyị ga-eme ihe niile anyị nwere ike iji chekwaa ala nke nna nna anyị ha hafere anyị n'aka. Aka na-achị Anamabra steeti bụ Charles Soludo akpọkuola ọha ndị mmadụ ma arịọ ka onye ọbụla nwere ozi etu a ga-esi anwụchi ndị gburu Omeiwu Okechukwu Okoye pụta kwuo. Ndị omekome a ma beghị ndị ha bụ tọọrọ Okoye na onye enyemaka ya bụ Cyril Chiegboka n'abalị 15 nke ọnwa Mee, gbuo ya ma bepụ ya isi tọgbo ozu ya n'okporoụzọ si Nnobi gawa Ideani ka ọ gachara abalị isii n'aka ndị omekome ahụ. N'ozi a, nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Christian Aburime binyere aka, o dere,""Soludo etinyela nde naira iri dịka ego nrite nye onye ọbụla maọbụ otu ọbula ga-eweta ozi ga-enye aka ka anwụchie ndị kpara arụ a''. Soludo, onye gara n'ihu kwe nkwa na oge na adịghị anya na Anambra ga-aghọ ọkụ mmụọ nye ndị omekome kwuwara, ""Anambara ga-emeri ikike ọchịchịrị"". Ndị omekome egbuola onyeomeiwu na-anọchite anya mpaghara Aguata II n'ụlọomeiwu Anambara steeti bụ Okechukwu Okoye . A tọọrọ Okoye, onye Isuofia ma bụrụkwa onye na-anọchite mpaghara ebe Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambara. Egbukwara onye enyemaka ya bụ Cyril Chiegboka. Cheta na a tọọrọ Okoye na onye enyemaka ya n'abalị 15 nke Ọnwa Mee dịka ha nọ n'ụzọ njem na steeti ahụ. Ndị omekatara ihe daa ụjọ nwụchiri ya gburu ya, hapụ ahụ ya ebughị isi n'okporoụzọ Nnobi gawa Ideani n'abalị iri na otu nke ọnwa Mee, dịka ndị uweojii steeti ahụ si kwuo. Mana e mechara hụ isi ya n'ọdọụgbọala n'Amichi dị n'okpuru Ọchịchị Nnewi-South dịkwa na steeti ahụ n'otu ụbọchị ahu. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo n'ozi o depụtara na,"" Dịka ndị uweojiina-agba mbọ etu ha ga-esi azọpụta Aguluzigbo Umiona, dị n'Okpuru Ọchịchị Aguata, nwa amadị a a tọọ n'ebe Elekere 5.30 n'okporoụzọ si a hụrụ ozu ya nke isi adịghị n'Okporoụzọ si Nnobi gawa Ideanị n'Elekere 4 nke mgbede abalị 21 nke ọnwa Mee, afọ 2022"". Ikenga, onye kwuru na a hụkwara ozu Chiegboka n'ebe e dotara ozu Okoye gara n'ihu kwuo na a dọnyele ozu ya n'ụlọozu. N'ikwupụta maka ọnwụ ya, Govanọ Charles Soludo onye tụrụ arịrị maka nke ma kwuo ""ihe a dị oke mwute na egburu ụmụ Isuofia abụọ"". N'ozi iti aka n'obi o wepụtara nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Christian Aburime binyere aka, Soludo rụtụrụ aka na ọ bụ ndị omekome ahụ wakporo ya ma gbagbuo ndị uweojii ya afọ abụọ gara aga bụ ndị kpara arụ ahụ. O kwuru na gọọmentị ya agba mbọ ịchọta ndị aka ha dị n'ọnwu nwa amadị ahụ ka ha gaa zara ọnụ ha n'ụlọikpe. Onye bụdị Okechukwu Okoye a ọnwụ ya na-akpọtụ? Akụkọ ka na-abịa." https://www.bbc.com/igbo/61539966 +politics Gọọmentị Imo state ma maka akpụrụakpụ Rochas a na-akwatu - Ọnụ na-ekwuru Ihedioha "Ọ dịzị ka ọ bụ chi foo ụtụtụ ọbụla a nụ maka ihe a kwaturu n'Imo steeti mana gịnị ka gọọmentị steeti ahụ nwere ikwu maka ya? BBC Igbo kpọkuru Steve Osuji bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche n'ihe gbasara mgbasaozi nke Gọvanọ Emeka Ihedioha, onye kwuru na uche gọọmentị dị n'ihe na-eme. Osuji kwuru na a kwaturu ụfọdụ ihe dị n'ọgbọ ebe a kpọrọ ""Freedom Square"" makana ọ nọghị n'atụmatụ e mepụtara maka ebe ahụ n'Imo steeti. Osuji kwuru na e wepụtara ebe ahụ a na-akpọ Concorde Boulevard ka ọ bụrụ ebe ahịhịa ndụ a haziri ọfụma ga na-eto, na ọ bụghị ebe e dewere ka okwute nọrọ. O kwuru na gọọmentị ha ka ga-akwatucha ihe niile gọvanọ chịburu achị bụ Rochas Okorocha rụrụ na steeti ahụ, nke nọchiri ụzọ Concorde Boulevard ahụ maka na ọ bụ ebe e wepụtara ka a kụọ osisi na ahịhịa na-eme ka ụzọ maa mma. Ọ jụrụ sị ""kedụ ihe Rochas jiri ego Imo steeti rụọ dị mma Ihedioha kwaturu?"" na ọ bụ naanị ndị nke adịghị mma ka ọ ga-ewepụ. Gọọmentị ọ ma maka ""akantị a gbara nwa Rochas""? Osuji tinyekwara ọnụ n'okwu nwa Okorocha bụ Uloma Nwosu akụkọ kwuru na a gbara ya akantị ka ya na ndị ọrụ nnakọta (task force) zutere. O kwuru sị na gọọmentị akwadoghi mmadụ iji mmegide napụta onye ọzọ ihe, ọkachasị etu a na-achọ ịnapụta ihe ndị ha sị na Rochas Okorocha na ndị otu ya 'zuru' n'oge ọchịchị ha. O kwuru na gọọmentị ha ga-anakọtacha ihe niile Okorocha ""zuru"" tupu ha agawa ụlọikpe ịma ma aka ha adị ọcha maọbụ ọ dịghị. O kwukwara na ha ga-esi ụzọ ziri ezi mee ihe ndị a, makana gọọmentị nwekwara ikike ime nke a. Cheta na a malitere ịkụda ""Akachi"" bụ ihe a kpụrụ akpụ n'Owere, mere ka ndị mmadụ na-ajụ onye zitere ndị bịara kụtuo ya. Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49189398 +health Maurice Iwu: Ọ ka mma ịgbalahụ coronavirus site na iri nri ga-echedo ahụ gị "Ọkammụta n'ihe gbasara ọgwụ e si na mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ emepụta bụ Maurice Iwu ekwuola na ọ ka mma mmadụ ichedo ahụ ya ka ọghara inweta ọrịa coronavirus. Iwu, onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ụbọchị Tuzde, kwuru na-etu enweghị ọgwụ azụzụ, na-enweghị ọgwụ nje 'coronavirus' ugbua, ""ọ bụ etu isi chekwata onwe gị site n'iri ezi nri."" O kwuru na nri dịka ""ji mmiri ọkụ e ji ụtazi na ose sie ya, ị nụọ ya, ya agbasie gị ahụ."" O kwukwara na ugu, onugbu nakwa akwụkwọ nri ndị ọzọ dị mkpa. N'okwu ọgwụ ọgwụgwọ coronavirus Iwu sị na e nwere ihe atọ dị n'ala Igbo e were ike inye aka ịgwọ ọrịa coronavirus. O kwuru n'ụfọdụ ihe ndị a bụ ihe dị n'ọgwụ ahụ o mepụtara nke a na-atụlee ma aga-anabata maka ọgwụgwọ coronavirus. N'okwu ihe mere gọọmenti etiti ji gbahapụ ọgwụ Maurice Iwu ga were nke ndị mba Madagascar, Iwu kwuru na onye na-azụ ahịa bụ nke masịrị ya ka ọ ga-azụ. Lekwa ihe ndị ọzọ di mkpa o kwuru:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-52724616 +politics Anambra Election Update: Lee akụkọ ụgha na-efegharị gbasara ntuliaka Anambra steeti "Ọ fọla ụbọchị ole ma ole tupu ụbọchị ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti eruo. Cheta na ọ bụ na abalị isii nke ọnwa Nọvemba ka a ga-eme ya bụ ntuliaka. Mana ọtụtụ akụkọ ụgha amalitela ifesasị, ọkachasị na soshal midia, gbasara ntuliaka ahụ. Akụkọ a bụ iji tiwaara gị akụ oyibo Nsugbe, ma kọwaara gị ihe ndị bụ eziokwu na ndị bụ okpotokpo asị. Akụkọ efesaala na soshal midia na ngalaba ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission"" (Inec) ga-akagbu ntuliaka Anambra steeti. Ndị bipụtara akụkọ a bụ ụlọọrụ a kpọrọ onyeomablog.com, n'ụbọchị 27 nke ọnwa Sepụtemba afọ 2021. Dịka akụkọ ahụ siri kwuo, Inec sị na ihe mere ha ga-eji kagbuo ntuliaka hụ bụ n'ihi ọnọdụ enweghị nchekwa dị n'Anambra steeti. Mana ya bụ akụkọ bụ asị, n'ihi na INEC enwebeghị mgbe ha pụtara kwuo na ntuliaka Anambra agaghị enwe isi. Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii ekwuola na ha ga-eziga ndị ọrụ ha ọnụọgụgụ ha dị 34,587 iji weta ezi nchekwa n'oge ntuliaka ahụ. Akụkọ ụgha ọzọ fesara gbasara ntuliaka Anambra bụ nke kwuru na ọtụtụ ndị ọrụ INEC agbaala arụkwaghịm na steeti ahụ n'ihi ụjọ. Otu n'ime ndị bipụtara ya bụ akụkọ bụ ụlọọrụ kpọrọ onwe ha 'everydaynewsngr.net.' Ya bụ akụkọ fesakwara nke ukwu site n'ọba nzikọrịtaozi ""Whatsapp"". Mana onweghị otu mkpụrụ eziokwu dị na ya bụ akụkọ, dịka Inec siri kowaa. Onye ji ọkwa 'Resident Electoral Commissioner' na Inec Anambra steeti bụ Nwachukwu Orji kọwara na INEC nwezuru ndị ọrụ ha chọrọ maka ntuliaka Anambra steeti. Orji kọwara nke a n'ọgbakọ e nwere n'Awka n'ụbọchị Tuzde, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Ọktoba a. Oge BBC kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru INEC n'Anambra steeti bụ Samuel Nimem, o kwukwara na akụkọ ahụ bụ ụgha. Ọ kọwara na ""Inec ka na-enye ndị mmadụ tinyere akwụkwọ ịrụ ọrụ na ntuliaka a ọzụzụ"". ""Ọ bụ ndị mere ọfụma n'ọzụzụ a ka anyị ga-ahọrọ ka ha soro rụọ ọrụ."" ""Anyị ahọpụtabeghị kpọmkwem ndị ga-eso rụọ ọrụ. Kedụzị etu ndị ahọpụtabeghị ga-esi gbaa arụkwaghịm?"" Otu ụlọọrụ a kpọrọ 'starconnectmedia.com' dere akụkọ n'ọnwa Julaị 2021, wee kwuo na nwaada aha ya bụ Ndidi Nwuneli chọrọ iso zọọ ọkwa osote gọvanọ Anambra steeti. Akụkọ ahụ kwuru na ọ bụ Mazi Akachukwu Nwankpo nke nọ na pati ""African Democratic Congress"" (ADC), chọrọ ịhọrọ Ndidi Nwuneli dịka osote ya. Mana oge ụlọ ntaakụkọ 'The Cable' kpọtụụrụ ya bụ nwaanyị, o kwuru na akụkọ ahụ bụ nnukwu asị. Nwuneli kwuru sị: ""Akụkọ a bụ asị kwọ nwa. Enweghị m mmasị ọbụla ịbanye ndọrọndọrọ ọchịchị.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-59057733 +sports Nigerian Sumo Wrestler: Ihe mere m jiri gbaa mgba Sumo na Japan - Emeka Okeke (Baba Mutum) Akụkọ etu Emeka Okeke eji C-to-C maọbụ Baba Mutum mara siri gaa mba Japan ma turu ugo na mgba Sumo. Ọ bụ onye nke atọ na mba ụwa niile oge ọ na-agba ya bụ mgba. Ọ kọọrọ BBC Igbo etu njem ya siri bido ma ihe mere o jiri kwụsị ịgba mgba Sumo ma bido ụlọọrụ na-ahụ maka ibu sị mba ofesi. Lee akụko ya ebe a. Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Vining Ogu https://www.bbc.com/igbo/59487822 +entertainment Obi Cubana: Ihe mere m ji tiere ya egwu 'Ọkpataozuora' - Anyi Dons (Onye Ịchaka) "Anyi Dons (Onye Ịchaka) na-eti egwu kọwaara BBC Igbo ihe mere o ji tiere Obi Cubana egwu ọ kpọrọ 'Okpataozuora'. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Anyi Dons sị na o tiri egwu ahụ iji kwanyere Obi Cubana ugwu ma kelee ya n'ihi ọrụ ọma ọ na-arụ. Ọ sị na ọ bụghị naanị n'ihi ihe Cubana meere ya kama ma nke o mere ọtụtụ ụmụ ntoroọbịa bụ ndị o nyere aka n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ. Anyi Dons sị na o tipụtala egwu ahụ tupu Obi Cubana elie nne ya n'ọnwa Julaị afọ 2021 bụ mgbe egwu a malitere na-ewu ewu. Cheta na aha Obi Cubana malitere ịda ụda na soshal midia nakwa Naịjirịa n'oge ahụ o liri nne ya n'obodo ya bụ Oba dị n'Anambra Steeti. Nsi e nyere m mere m ji tipụta egwu 'Deputy Jesus' - Anyi Dons, onye Ịchaka Ifeanyi Donatus na-eti egwu ọdịnala Igbo bụ onye e ji 'Anyi Dons' (Onye Ịchaka) maara akọwaala na ọ bụ mgbe ọ gbakere site na nsi e nyere ya mere o ji tipụta egwu ọ kpọrọ ""Deputy Jesus"". Anyi Dons kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Fraịde, sị na ndị mmadụ na-eme ka ha bụ chi na ndụ ya ma na-enwe anya ụfụ na obi ọjọọ n'ebe ọ nọ. Anyi Dons kọwakwara ọtụtụ ihe banyere ndụ ya nakwa egwu ndị ọ tipụtarala. Ọ sị na ọ malitere iti egwu mgbe ọ dị obere, na mgbe ahụ ọ na-apị 'piano' n'ụlọụka ebe nna ya bụ ụkọchukwu n'afọ 1998. Ọ sị na nna ya anabatachaghị egwu ọ na-eti mgbe ahụ maka na o chere na egwu chọrọ ịkpọrọ otu nwa nwoke ya nke mere na ọ chọrọ ịkwụsị ya iti egwu. Anyi Don sị na ọ ego mbụ ọ natara site n'iti egwu bụ otu narị naịra na iri ise (N150.00) n'afọ 2000. N'afọ 2002, Anyi Don sị na ọ malitere itinye ọnụ na-ekwere ndị na-eti egwu ukwe n'egwu ha. Nwamadị a sị na o tiela egwu di iche iche nke gụnyere; Igbo nwere mmadu,Akpagi, Deputy Jesus, Okpata ozuora, Offor nakwa ndị ọzọ. Kirie ihe o kwuru banyere ndụ ya n'ụju. Ihe ndị ọzọ i kwesịrị ịma maka Anyi Dons" https://www.bbc.com/igbo/afirika-58601462 +health Coronavirus aghọọla ọrịa 'o zuru-ụwa-ọnụ' - WHO "Otu ahụike mba ụwa bụ WHO n'aha ịchafụ akpọpụtala Coronavirus dịka ọrịa 'o zuru ụwa ọnụ' nke Bekee kpọrọ ""pandemic"" dịka ọrịa ahụ metụrala mmadụ 118,000 na mba 114 countries, ebe mmadụ 4,291 tụnyerela ndụ ha. Onyeisi WHO bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus bụ onye kwupụtara nke a na mgbede Wenezde ka ọ na-agwa ndị ntakụkọ okwu,kwuru na nnu aghala ya bụ ofe dịka ọrịa ahụ. "" WHO na-elebanye anya n'ọrịa kemgbe ọ gbakapụtara ma ihe kachasị echu anyị ụra bụ ka o si efesasị na-akpa ike nakwa ka ọtụtụ siri gba nkiti ghara ime ihe ọbụla."" ""Puku kwuru puku nọ n'ụlọgwụ na-alụ ọgụ ọnwụ na ndụ. ""Thousands more are fighting for their lives in hospitals. N'abali ole na izuụka ole na-abịa, anyị na-atụ anya na ọnụọgụgụ ndị nwere #COVID19, nakwa ndị ga-anwụ site n'ọrịa nakwa mba ndị ọ ga-emetụta ga-agbali karịa."" Dr Tedros gara n'ihu kwuo na n'izuụka abụọ gara aga, ndị burula ọrịa ma agụpụ Chaina dị mmaji iri na atọ, ebe mba dị oferela dị mmaji atọ. ""Ugbua enweela mmadụ 118,000 na mba 114 countries, ebe mmadụ 4,291 tụnyerela ndụ. "" O kwuru na ụfọdụ mba enweghị ndị ọrụ doro anya , ụfọdụ obodo enweghị ihe ọ ga-eri, ebe mba ụfọdụ enweghị mkpebi obi ime ihe kwesịrị."" Ihe mere na Mgbo, Ebonyi steeti Nwa eze obodo Ngbo dị na Ebonyi steeti bụ Uche Ali ekwuola ọgbaghara tara isi ọtụtụ mmadụ n'obodo ha ụbọchi Tuzde bụ okwu ala dị n'etiti ha na ndị Agila dị na Benue steeti, na ọ bụghị nso ndị ọchịehi. Ị nụla na ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa amalitela itinye anya n' iwu ga-amachi ịtụbata maọbụ ire igweọkụ latrik. Sanusi na El-Rufai Nke a bụ ọrụ nke abụọ Gọvanọ Nasir El-Rufai na-enye Sanusi na abalị nabọ a chuturu ya n'oche eze. Ụlọikpe mba Amerika atụọla nwoke amama amam na Hollywood bụ Harvey Weinstein nga afọ iri abụọ na atọ maka ịwakpo ụmụnwaanyị. Ebugharịala asọmpị dị n'etiti otu Arsenal nakwa Manchester City n'ihi ọrịa Coronavirus. Ozi otu Arsenal dere na peeji ha sị na ọtụtụ ndị ọgba bọọlụ ha na Evangelis Marianakis nwe otu Olympiakos enweela mmekọ mbụ. Cheta na nje a abụghi akuko ifo. Gbado anya ma ga BBC Igbo dọt kọm gụọ akụkọ anyi nwere gbara ya. Ụlọikpe eyigharịala ikpe Sowore ọzọ Ụlọikpe ukwu na Abuja eyighrịala ikpe Omoyele Sowere onye kpokọbara ""#Revolutionnow"" ọzọ. Ha bụgara ya ụbọchị 1 na 2 ọnwa Eprelụ iji nye ohere ka ndị gbara ya akwụkwọ wekọta ihe ndị akaebe ha chọrọ iji kpe ikpe. Ijeoma Ojukwu bụ onye ọkwaiwu kachasị na ya bụ ikpe gbarụrụ ihu maka etu ndị gbara akwụkwọ esighị dị njikere n'ikpe a. Cheta na gọọmentị Naịjirịa boro Omoyele Sowore ebubo ịgba mgba okpuru nke mere ha ji jichie ya ọnwa ole na ole n'afọ gara aga. Ọ bụ Buhari nyere iwu ka achụtuo Sanusi Lamido - Kwankwaso Aka chịbụrụ Kano steeti bụ Rabiu Kwankwaso etinyela ọnụ n'okwu na-akpọtụ maka Sanusi Lamido Sanusi. Kwankwaso kwuru na ọ bụ onyeisiala Buhari nyere iwu ka a chutuo ya n'ọkwa sị na ""ndị isi n'ebe ahụ n'onwe ha kwuru na e si n'elu nye ha iwu."" Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Monde ka Gọvanọ Umar Ganduje nke Kano steeti chụturu Emir Sanuisi Lamido Sanusi n'ọkwa ma dochie onye ọzọ. Rue ugbua, anụbeghị 'pịm' n'ọnụ Onyeisiala Buhari maọbụ gọọmentị ya n'ihe na kpọtụ na Kano steeti. Minista na-ahụ maka ahuike ndị mba Briten bụ Nadine Dorries ebutela ọrịa coronavirus. Dorries onye dị afọ iri isiina abụọ kwuru na ọ wepụrụ onwe ya iche n'ụlọ ya mgbe ọ chọpụtara na o bu ya bụ ọria Coronavirus. Mịnịsta Dories bụ onye mbụ bụ onye omeiwu Briten bu ọrịa Coronavirus. Ndị bu ọrịa a na mba Briten eruola mmadu narị atọ iri asatọ na abụọ ebe mmadụ isii lagoro mụọ maka ya bụ ọrịa na Briten. Dịka ọ dị ugbua, Dorries kwuru na akwụkwọ ọ depụtara na ngalaba na-ahụ maka ahuike ebidola ịchọpụta ndị niile ha na ya nwere mmekọ. O kwu kwara na twitter ya were sị ""Ọ bụchaghị ihe nwere isi, ebum n'obi na nke ka njọ agafela...kama ọ bụ nne m gbara afọ iri asatọ na anọ mụ na ya bị bidoro kwọwa ụkwara ka ụche m dị."" ""Ọdọụgbọelu Enugwu agafena Eprelu"" - Ndị ụlọomeiwu Ndị ụlọomeiwu ukwu na nta nke Naịjirịa agbarụọla ihu gbasara ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam nke dị n'Enugwu. Ha gwara ndị ji ọrụ ngo ahụ ha gbaa mbọ rụtọpụ ya n'ọnwa Eprelu dịka ha si kwe nkwa maọbụ anapụ ha ya bụ ọrụ n'aka. Onyeisi otu ndị omeiwu na-elekọta njem ụgbọelu bụ Nnolim Nnaji kwuru nke a dịka ha gachara njem nleta n'ụdọụgbọelu ahụ. Sanusi Lamido eritela ọkwa ọzọ Gọvanọ na-achị Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai etinyela Sanusi Lamido Sanusi bụ bụ eze Kano n'ọkwa na ngalaba na-ahụ maka mwulite akụnaụba steeti ahụ. Nke a na-abịa dịka Sanusi Lamido na-akwado ị ga ụlọikpe ịgbagha nchutu achuturu ya n'oche. Ronaldinho atọla na mkpọrọ Otu ọkaiwu na mba Paraguay ajụla ịnye ikike ka atọghapụ ọgba bọolụ a ma ama bụ Ronaldinho n'ụlọ mkpọrọ. Cheta na anwụchịrị ya na nwanne ya nwoke n'ụbọchị Fraide izuụka gara aga maka iji akwụkwọ njem adịgboroja bata mba ahụ. Gee akụkọ ụwa n'ime otu nkeji ebe a" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51813257 +sports World Cup 2019: Etu Naịjirịa si agbanwe etu esi ahụ bọọlụ ụmụnwaanyị "Ịsonye n'egwuregwu iko mbaụwa ụmụnwaanyị karịrị nanị igba bọọlụ n'anya ndị gbara Naịjirịa. Otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị nke Naịjirịa bụ naanị otu egwuregwu tozuru ịsonye n'asọmpị iko mbaụwa kamgbe afọ 1991 mana ha ka na-agabiga ọtụtụ ihe mgbochi. Ụfọdụ ndị Naịjirịa anaghị ahụ ịgba bọọlụ dịka aka ọrụ nye ụmụnwaanyị. Asisat Oshoala dị afọ iri abụọ na anọ kwuru na agwa a gụnyere Afrịka niile. Mana o kwuru na ha na-agba mbọ ịgbanwe echiche a. Naịjirịa nweterala pọinti atọ dịka ha na South Korea na Norway gbachara n'egwuregwu mmepe. Ha na France ga-achịpụ ya taa na mgbede . Mana agbanyeghị ihe niile a, otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa na-enwe mmeri. Egwuregwu bọọlụ n'Afịrịka anaghị ewu ewu etu o si ewu na mba Europe dịka Oshoala si kọwa ma na-ekwusi ike na o nyeghị ọnụ. ""N'Afịrịka, ọtụtụ nne na nna achọghị ka nwa ha gbaa bọọlụ. Ha chọrọ ka ha gaa ụlọ akwụkwọ"" Francisca Ordega dị afọ iri abụọ na ise n'agbara Shanghai Shengli kwuru na ndị Naịjịrịa anaghị esete iko mbaụwa a mana ọ bụrụ nke ụmụnwoke ihe dị iche ga-adị. Ọtụtụ ndị gbara m okiri na-ekwu na agaghị m alụ dị makana m na-arụ ọrụ. Agbara m isi akwara na-eme ihe na-enye m obi aṅụrị. Taa emerie m ha O nwere ihe a ga-agbanwenwu maka agwa a?" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48652545 +politics """Ihe m chere maka ọpụpụ Peter Obi na PDP na ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ..."" - Bode George" Bode George bụ onye ndu Peoples Demcoratic Party akọwaala kpọmkwem ihe butere esemokwu n’etiti Atiku Abubakar, Nyesom Wike na Ayo Iyorcha. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, George sị na ọ bụ etu e si kesa ndị ji ọkwa ọchịchị na PDP na-ese okwu. Ọ sị na otu n’ime ndị a bụ mpaghara ebe onye onyeisioche pati ahụ si pụta. George sị na ndị tọrọ ntọala ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa gụnyere Alex Ekwueme, Bola Ige, Jim Nwobodo na ndị ọzọ bịara kee Naịjirịa mpaghara isii iji hụ na udo chịrị. Ntọala a hụrụ na mpaghara ọbụla ga-ahọpụta onye ga-eji ọkwa ọchịchị na gọọmentị etiti malite n’Onyeisiala ruo n'onyeisioche pati ha. George sị na ihe dị n’iwe pati ha bụ PDP bụ na a ga na-eke ọchịchị bụ zoning, mana o rutere ugbua ihe niile nyụọ ka ọkụ. Ọ sị na ọ dịghị mma ka onye na-azọ ọkwa onyeisiala na onyeisioche pati ahụ si n’otu mpaghara pụta. Ọ gara n’ihu dụọ ndụmọdụ sị na ọ bụrụ PDP akpachaghị anya na ha agaghị achịta aja na ntuliaka afọ 2023. George tinyekwara ọnụ maka ọkwa ọchịchị Peter Obi nke Labour pati nakwa Bola Tinubu nke APC na-azọ. https://www.bbc.com/igbo/articles/cjeyy9v59j5o +health Maurice Iwu: Ọ ka mma ịgbalahụ coronavirus site na iri nri ga-echedo ahụ gị "Ọkammụta n'ihe gbasara ọgwụ e si na mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ emepụta bụ Maurice Iwu ekwuola na ọ ka mma mmadụ ichedo ahụ ya ka ọghara inweta ọrịa coronavirus. Iwu, onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ụbọchị Tuzde, kwuru na-etu enweghị ọgwụ azụzụ, na-enweghị ọgwụ nje 'coronavirus' ugbua, ""ọ bụ etu isi chekwata onwe gị site n'iri ezi nri."" O kwuru na nri dịka ""ji mmiri ọkụ e ji ụtazi na ose sie ya, ị nụọ ya, ya agbasie gị ahụ."" O kwukwara na ugu, onugbu nakwa akwụkwọ nri ndị ọzọ dị mkpa. N'okwu ọgwụ ọgwụgwọ coronavirus Iwu sị na e nwere ihe atọ dị n'ala Igbo e were ike inye aka ịgwọ ọrịa coronavirus. O kwuru n'ụfọdụ ihe ndị a bụ ihe dị n'ọgwụ ahụ o mepụtara nke a na-atụlee ma aga-anabata maka ọgwụgwọ coronavirus. N'okwu ihe mere gọọmenti etiti ji gbahapụ ọgwụ Maurice Iwu ga were nke ndị mba Madagascar, Iwu kwuru na onye na-azụ ahịa bụ nke masịrị ya ka ọ ga-azụ. Lekwa ihe ndị ọzọ di mkpa o kwuru:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-52724616 +religion Akụkọ dị mkpa taa: Pope Francis eyipụla mmadụ abụọ uwe fada Pope Francis ekpebiela maka fada abụọ Onyeisi ndị otu ụka katolik bụ Pope Francis eyipuola mmadụ abụọ sị mba Chile uwe fada maka ebubo nwakpo ụmụaka. Pope Francis kwuru na ha ka na-enyocha ọtụtụ fada ndị ọzọ tinyere aka nudi emume a. Buhari emeela mkpebi ọhụrụ Gọmenti etiti ekwuola na ha ebidoola ịnyocha ndị Naijiria bụ ndị ọnụ na-eru n'okwu ruru iri ise maka emume gbasara mpu na aghụghọ. Ọ bụ onye mgbasa ozi gọọmenti a bụ Garba Shehu zipuru ozi a mana o nweghị aha ọbụla ọkpọrọ n'ime yabụ akwụkwọ ozi. N'egwuregwu Onye bubu onye ọgba bọọlu otu Arsenal bụ Thierry Henry nke ayị na-akpọ Igwe abuola onye nchikọta otu bọọlụ n'obodo Monaco. Henry binyere aka n'akwụkwọ kwuru na ọ ga-abụ onye nchịkọta ha ruo afọ 2021. Gee nkeji nke taa Ọkụ agbagbuola ụmụ mmadụ n'Abịa steeti Ọkụ si na okporo mmanụ agbagbuola ihe ruru mmadụ iri n'itoolu n'Abịa steeti mgbe ụfọdụ ndị ntorobia gara ohi mmanụ agbidi ebe ahụ. Onye ọrụ ngalaba na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ NNPC akpọrọ Ndu Ughamadu kwuru na ya bụ ihe mberede mere n'ime obodo Umudaru. Na ndọrọndọrọ Otu PDP ekwuola na ihe ha jị họrọ Peter Obi dịka onye ga-eso Atiku zọ ọkwa onyeisiala abụghị maka na o si na mpaghara ọwụwa anywanwụ Ha kwuru na o zuru oke n'ihe niile a na-achọ n'ime onye ga-abụ osote onyeisiala. Akụkọ Teknụzụ, Ọ bụrụ na ịnwere akara Facebook oge eruola iji gbanwe passwordu gị Maka gịnị? N'ihi na Facebook ekwuola na ndị na-eji ụzọ ezihi ezi abanye akara ndị mmadụ awakpoola akara ruru nde iri abụọ n'itoolu. N'Egwuregwu, Otu egwuregwu mba Libya ruru mmadụ iri ise atụọla n'Uyo dịka ha na akwado ịzute otu super eagles n'ụbọchị satọde. Nzute ahụ ga-egosi onye tozuru ịga asọmpị Afrịca cup of Nations n'afọ 2019. https://www.bbc.com/igbo/afirika-45843803 +religion CAN ahọpụtala Daniel Okoh dịka onyeisioche ọhụrụ "Otu Christian Association of Nigeria ahọpụtala Daniel Okoh dịka onyeisi ọhụrụ otu ahụ. Ọnụ na-ekwuru ha bụ Bayo Oladeji gwara BBC Igbo n'ekwentị na nzụkọ akpọrọ 'The Assembly' kwekọrịtara na nhọpụta Okoh dịka onyeisi ọhụrụ ha. Nke a pụtara na onyeisi ochie ahụ Rev Olasupo Ayokunle ga-enyefe ya ọchịchị n'aka n'emume a ga-eme n'ụbọchị Fraịde. Daniel Chukwudumebi Okoh bụ ụkọchukwu kachasị n'ụlọụka Christ Holy Church a ma dịka ""Nation Builders"" maọbụ Odozi obodo. A mụrụ ya na Kano na Nọvemba 12, afọ 1963. Ọ bụ onye Ndoni dị n'okpuruọchịchị Ogba/Egbema/Ndoni dị na Rivers steeti. Ọ lụrụ Ngozi dịka nwunye ya ma jirikwa ụmụ anọ. Okoh arụọla ọrụ ihe karịrị afọ iri abụọ dịka onye na-ekwuchitere ndị ụka Kraịst n'ọgbakọ okpukpere ndị ọzọ. Ọrụ ahụ ọ na-arụ gụnyere ma na Naịjirịa ma na mba dị icheiche n'ụwa niile. Ụfọdụ ọkwa ọ nọrọla na ya gụnyere: - Onyeisioche ọgbakọ ụlọụka okpukpere Kraịst dị na Afrịka bụ OAIC n'ịchafụ - Onyeisi otu OAIC na Naịjirịa (2005 - 2014) - Osote onyeisi CAN na Naịjirịa (2007 - 2013) - Okoh so na mmadụ isii gọọmentị etiti họpụtara n'ọgbakọ idozi ndọrọndọrọ n'afọ 2005. - Okoh so na ndị isi na-elekọta National Orientation Agency site n'afọ 2009 rue afọ 2011. Cheta na akụkọ fegharịburu n'ụbọchị Wenzde na otu jikọrọ ndị okpukpere Kraịst na Naịjirịa bụ CAN n'ịchafụ ahọpụtala onyeisioche ọhụrụ. Mana mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Bayo Oladeji, ọ gwara anyị na o nweghi eziokwu dị na akụkọ ahụ. ""Ọ bụ akụkọ ụgha, ihe mere bụ na ndị mmadụ wepụtara aha Daniel Okoh dịka onye nwereike ịbụ onyeisioche mana anyị emebeghi mkpebi maka ya"" ka o kwuru. O gara n'ihu kwuo na ọ bụ n'ụbọchị Tọzde kpọm kwem ka a ga-akpọpụta onyeisioche ọhụrụ otu ahụ. Onye bụbu onyeisi otu ahụ bụ Reverend Olasupo Ayokunle banyere n'ọkwa ahụ n'afọ 2016. CAN bụ otu jikọrọ ụlọụka niile na-ekpere Kraịst n'ala Naịjirịa. E hibere ya bụ ụlọọrụ n'afọ 1976 mgbe ọ bụ naanị ụka Katọlik, ụka Anglịkan nakwa ụka ukwu ndị ọzọ dịka Baptist na Methodist. Ndị ụka Kraịsti hibere otu a iji kwụsịtụ njikọ ndọrọndọrọ na okpukpere alakuba na-aga n'ihu oge ahụ. Ha pụtakwara katọọ ma megide nsonye ala Naịjirịa n'ọgbakọ mba ndị okpupere alakuba bụ OIC n'afọ He mechaziri gaa n'ihu nabata obere ụlọụka ndị ọzọ n'ime ogige ha. Ha nwere ngalaba nke ụmụ nwaanyị akpọrọ WOWICAN nke Oyin Mabel Sowoolu bụ onyeisi ha ugbua." https://www.bbc.com/igbo/articles/ce9jv489jq8o +business Ọgba mbọ: Lee Nwoke gbara afo 57 nwaanyi na-anwuru ka o mee ha isi Success Okorie bụ nwoke dị afọ 57 ji ime ụmụnwaanyị isi agba mbọ n'Owere, Imo steeti. Okorie gwara BBC Igbo etu o si malite n'ihazi egwu ma si na ya wụbanye n'imezi isi kemgbe afọ 35 gara aga. Ka o si kwuo, ọ zụọla ihe ruru mmadụ narị anọ (400) n'ọrụ aka a. O kwukwara na ụmụ ya amụọla ọrụ aka ya a, ma jirikwa ya na-akpa ego n'agbanyeghi na ha agachaala mahadum Gee ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju: Ndị mere akụkọ a bụ Chris Okereke na Nnamdi Agbanelo https://www.bbc.com/igbo/afirika-53619755 +entertainment Ị chọrọ ka ụbụrụ ụmụ gị dị nkọ? Were ihe onyonyo a kuziere ha etu e si azụ okwe 'chess' N'ihe onyonyo, ọnye ọkaibe n'oge 'chess' kuziri etu e si azụ okwe, rie ya ma were mee ka ụbụrụ dị nkọ: Ọrụ a si n'aka Vining Ogu https://www.bbc.com/igbo/afirika-53528078 +health Bacterial Vaginosis: Lee ihe na-ebutere ọtụ nwaanyị isi ọjọọ "Ọtụ isi isi bụ ihe na-eme ụfọdụ ụmụ nwaanyị kama dịka ọnọdụ ya bụ ihe siri dị, ọtụtu anaghị ekwu maka ya. Dr Genb Gunter bụ ọkammụta maka ihe gbasara ịmụ nwa na-ahụ ụmụ nwaanyị gwara BBC na ọtụ ṅwaanyị na-asa onwe ya ma dobe onwe ya ọcha. Gunter kwuru na Ceelụ dị n'ime ọtụ nwaanyị na-edochi onwe ya dịka awa iri itolu na isii ọbụla gachara. Nke a pụtara na ọtụ nwaanyị nwereike ịdebe ime onwe ya ọcha. Kama ụfọdụ mgbe ọtụ na-esi isị pụrụiche nke na-ebute nchegbu na ihere. Anyị kpọtụrụ onye na-ahụ maka ịmụ nwa akpọrọ Gynaecologist na beke bụ dọkịnta Akinde Joseph ka ọ tụpenyere anyị azụ ihe na-akpata ọtụ nwaanyị isi isi nakwa ihe onye ahụ ga-eme maka ya. Gịnị na-ebute ọtụ isi ajọọ isi? Dokịnta Akinde Joseph bụ dọkịnta na-ahụ maka ịmụ nwa kọwara na ya bụ onọdụ ọtụ nwaanyị isi isi bụ Bacteria Vaginosis ka ndị Sayensi na-akpọ ya. O kwuru sị, "" ọ bụ ""Gardenerella Vaginalis"" bụ nje na-ebute ọnọdụ a"". Ọ kwukara sị, "" otu n'ime ihe eji amata ọrịa a bụ ajọ isị na-esi ka azụ"" O kwuru na nwaanyị ọbụla butere ya jee ụlọogwụ nata ọgwụgwọ. Akinde kwuru si, "" Ọ bụ site na mmekọ nwoke na nwaanyị ka ya bụ ọrịa si efe"". Ọ kọwara na-anaghị ebute ya site na iji otu akwa hichaa ahụ maọbụ iyi otu akwa. Ọ bụ ma nwoke na nwaanyị na-efesa ya. Akinde kwukwara ka ụmu nwanyị na-edebe onwe ya ọcha Ka nwoke na nwaanyị hapụ ịgba n'ezi. Ọ kọwara sị, ""Cheta kwa na ọtụ ụmu nwaanyị na-emepụta mmiri nke bụ discharge n'okwu bekee nke mere na nwaanyị nwere ọnọdụ a kwesiri ịgbanwe ọba ya ihe dịka ugboro abụọ n'ụbọchị""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57531566 +entertainment Ada Jesus burial : Lee ka o si aga n'akwamozu ọkpaọchi a "Akwa na Anyammiri bụ ihe na-eru ka mmiri n'akwamozu Mmesoma Nnadi , onye ọkpachị a ma ama dịka Ada Jesus nke mere n'obodo dị ya bụ di ya n'ụbọchị Ejemewuru Oguta, Imo Steetị na Fraide(28/5/2021). Ada Jesus nwụrụ n'abalị 21 nke ọnwa Eprelu ka ọ rịachara ọrịa nwa oge site n'ọrịa akịrị. Ọ dị afọ nnaanị afọ 24 ka ọ nwụrụ. Igwe mmadụ gụnyere ezinaụlọ, ndị enyi, ndị ọgọ na ọtụtụ ndị ntorobia jupụtara dịka e buru ozu ya site n'ụlọozu Aladinma gawa obodo di ya dị n' Ejemekwuru n'Oguta 2, n'Okpuru Ọchịchị Ugwuta n'Imo steeti. Ụzụ akwa tụrụ n'elu na ala, obere na nnukwu dịka ozu nwata nwaanyị ahụ wuru ewu karịa okenye na-alọta be ndị di ya. Nne, nna, okoro na agbọghọ chị anyammiri n'aka. E mechara bụga ya n'ama ụlọakwụkwọ ndị n'ogbe ahụ maka ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ. Control Jay bụ onye na-ahaziri ya ihe ejije kwuru na ""ekwebeghị m na ọ nwụọla"". 'Echeghị m na o nwere onye ga-echezọ Ada Jesus n'afọ 50 na-abịa.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-57284093 +religion Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị ụkọchụkwụ emela ngagharị iwe n'Owerri Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Ndị ụkọchụkwụ ụka Katọlịk na ọwerrị mere ngagharị iwe ụnyahụ iji dọta echịche ndị gọọmentị Naijịrịa maka ndị otu ha egburu egbu na Benue. Ndị ụkọchụkwụ kwuru ka onyeisiala Buharị gbambọ chọpụta ndị merụrụ ala ahụ ma taa ha ahụhụ ka osikwesi. Buhari sị na-emeere Biafra Ebere Nwafọ Igbo bubu minista ahụike bụ Prof. Alphonsus nwosu agwala onyeisiala Buhari ya ga gbara ogwu ya nụọ. Onyeisala Buharị kwuru na Yakubu Gowan bụ onye amị chịrị Naịjirịa mgbe agha Biafra rịọrịọ ndị agha ha mgbe ahụ ha emesikwala ndị Igbo ike. Akụkọ mba ofesi Ọgbatauhie dakwasịrị mba Guatemala Akụkọ ọkụ na-abọpụta n'ala nke mere na Guatemala ụbọchị ụka akwụsịbeghị o. Ka ọdị ụgbụa achọpụtala na ya bụ ọkụ mmụọ ataala isi mmadụ iri assa na ise (75) ma merukwa ihe uru mmadụ narị abụọ ahụ. Mmh ọga dịcha mma. N'egwuruegwu, Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:Ihe nkiri nke taa: Lee ihe nkiri taa https://www.bbc.com/igbo/afirika-44369155 +politics Enugu LGA Elections: Ihe mere PDP ji zakọrọcha ọkwa na ntuliaka e mere n'Enugwu Steeti "Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka n'Enugwu steeti bụ Enugu State Independent Electorial Commission (ENSIEC) ekwuola na ọ bụ pati People's Democratic Party (PDP) meriri na ntuliaka niile e mere na Satọde bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Febụwarị. Agbanyeghi na ntuliaka a gara n'udo dịka BBC hụrụ n'anya, otu n'ime mmadụ abụọ n'azọ ọkwa onyeisi pati All Progressives Congress (APC) na steeti ahụ bụ Okey Ogbodo gwara BBC na pati ha esoghi na ntuliaka ahụ. N'iza ajụjụ maka ndị APC aha ha dị n'akwụkwọ ntuliaka, Maazị Ogbonna sị na ndị a abughị ndị APC. Ọ sị; ""Ndị ahụ bụ ndị APC n'ehihe ma bụrụ PDP n'abalị."" Ogbonna gara n'ihu kwuo na ntuliaka ahụ adabaghị makana ọ bụghị oge e kwesiri ime ya ka e mere ya. N'okwu ya, Ogbonna sị na ọ bụ mgbe oge ndị ọchịchị gwụrụ n'afọ 2019 ka ndi ọhụrụ kwesịrị irigoro n'ọkwa. ""Ndị PDP were ndị ha kpọrọ ""Transition Commitee Chairmen"" tinye n'ọkwa. Iwu obodo megidere nke a"" Ọ sị na ọ bụ nke a mere pati ya jiri gbajụọ isonye mee ntuliaka. Dọkịnta Uche Uzochukwu so na ndị isi PDP n'okpuru ọchịchi Ọgwụ gwara BBC na ya amaghi ihe onye APC na-ekwu makana etu ya si hụ ntuliaka ahụ, o gara nke ọma. Ọ sị, ""Na Nkwe be anyị, ebe m nọ tụọ vootu, ndị mmadu pụtara n'igwe bịa kwado PDP. Ndị APC pụtara enweteghi otu vootu."" Dọkịnta Uzochukwu sị na ọ bụ makana PDP na-eme ọfụma mere ndị mmadụ ji akwado ha nke ukwuu n'Enugwu. Onye na-anọchite mpaghara Ọgwụ n'ụlọomeiwu nke Enugwu steeti bụ Johnson Chukwuobasi kwenyekwara n'ihi Dọkịnta Uzochukwu kwuru. Omeiwu Chukwuobasi sị, ""O nwere onye be anyị, onye Mmaku, so zọọ ọchịchị n'aha APC, ọ chịtaghị aja maka na ọ bụ PDP ka ndị ebe anyị na-akwado."" 'Ihe mere PDP ji merie ebe niile' Dọkịnta Uzochukwu sị na aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi na-eme ọfụma nke mere ndị mmadụ ji sị ka PDP chịrị gawa. Ọ sị, ""Agaghị m asị na ọ bụ makana APC anaghị achịta na gọọmentị etiti mere ka ndị mmadụ na-akwado PDP, makana steeti dị iche iche. Nke bu eziokwu bụ na PDP na-eme ọfụma n'Enugwu site na gọọmenti Ifeanyi Ugwuanyi."" Omeiwu Chukwuobasi rụtụrụ aka n'usoro Bekee kpọrọ zoning, bụ atụmatụ PDP na-eso n'Enugwu, dịka otu ihe mere ndị mmadụ jiri akwado patị ahụ. Ọ sị, ""Zoning na-enye aka. Dịka ugbua, onye meriri ịbụ onyeisi ọchịchị ime obodo bụ onye Ọgwụ, onye rituru n'ọkwa bụkwa onye mpaghara ọzọ. Etu a ka e si eme ya."" Atụmatụ ""zoning"" a malitere n'Enugwu kamgbe Chimaroke Nnamani bụ gọvanọ steeti ahụ. Ya bụ atụmatụ metụtakwara etu e si a họpụta ndị ọchịchi Bekee kpọrọ ""Councillor"" Ebe APC kwụ Okey Ogbonna na-ekwusi ike na aka pati ya adịghị na ntuliaka ahụ, ma na-ekwukwa na ya nwere olileanya na ndịisi pati ha no n'Abuja ga-aghọta na ọ bụ ya ka ""ụlọikpe kpebiri dịka onyeisi APC n'Enugwu kpọmkwem.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51705949 +sports Chelsea Vs Man United: E ji Chelsea gbụchachaa ọnụ gbụfuo "Manchester United ji obi ndị Chelsea sie ""maị maị"" dịka ha gbawara ha aka napụ ha ohere ịzọ Iko Carabao. Goolu atọ e nyere n'ọgbọegwuregwu Stamford Bridge"" ezughị ịkwụsị mmadụ ịpụ n'asọmpi a. Ndị Man Utd bu ụzọ chịrị ọkụ bịa na nkeji 25 e ji bido bọọlụ, mgbe Marcus Rashford ji penariti dọkaa neetị. Mana Michy Batshuayi bịara saa ya na nkeji 61, nyetụ ndị Chelsea obere olileanya. Na nkeji 73, Rashford gosiri ihe e ji akwụ ya ụgwọ ọnwa, ka o ji mbada ""free kick"" tụkwasị goolu nke kpọnyere ntu n'akpati Chelsea. Goolu a mere ya goolu ise Rashford na-enye Chelsea kemgbe o jiri gbawara Man Utd bọọlụ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50227970 +health Coronavirus Immunity: I nwereike ibute coronavirus ugboro abụọ? "Ahụ igbochi ọrịa bụ isisekpuntị n'okwu banyere ọrịa coronavirus. Nsogbu bụrụ na onweghi anyị matụrụ obere ihe. Akụrụngwa mgbochi ọrịa bụ ihe na-ebuagha n'ahụ anyị megide nje ọbụla ma ọ na-abịa n'ụzọ abụọ. Nke mbụ bụ nke na-apụ ibuagha ngwa ngwa ọrịa batara n'ahụ mmadụ, gụnyere iwepụta kemịkalụ nakwa ọbara ọcha na-emebisi ebe ọrịa ndị ahụ metụtara. Mana ụdimịrị nke a apụghị ibuagha megide maọbụ chekwaa gị n'ebe ọrịa coronavirus nọ. Ihe ahụ gị chọrọ bụ nke a kpọrọ 'Adaptive Immune' bụ nke ga-esogide ọrịa ahụ iji gbochie ya nakwa nke ga-ebuso ya agha. Ọ na-ewe ahụ mmadụ abalị iri ịmịpụta akụrụgwa ga-ebuso ọrịa coronavirus agha. Onye kachasị arịa ọrịa na-ewepụta nke kachasị sie ike. Ọ bụrụ na 'Adaptive Immune' a siri ike, ọ ga-echekwa ahụ mmadụ megide ọrịa ruo oge dị anya n'ọdịnịhu. Ncheta mgbochi ọrịa dịka nke mmadụ, mgbe ụfọdụ ọ na-echeta ụfọdụ ọrịa nke ọma ebe ọ na-echefu ụfọdụ. Ọrịa coronavirus a kpọrọ Sars-CoV-2, anọtebeghi anya nke iji mara oge mgbochi ahụ ga-anọ, mana e nwere coronavirus isii ọzọ nwereike ịtụpenye azụ maka nke a. Anọ n'ime ha nwere njirimara ha dịka oyi ma mgbochi ya anaghị adị anya. Nyocha kwuru na onye rịaburu ọrịa a nwereike ibute ya ọzọ n'ime out afọ. Mana e nwere coronavirus abụọ ọzọ na-akpa ezigbo ike - Ndị nke bute ọrịa iku ume a kpọrọ ""Severe Acute Respiratory Syndrome (Sars) na Middle East Respiratoy Syndrome (Mers)"". Nke a hụrụ mgbochi ya dịka afọ ole na ole gachara. ""Ajụjụ abụghị ma ị ga-enwe mgbochi nye ọrịa a, kama ruo mgbe ole"" Paul Hunter bụ ọkanmụta ahụike na Mahadum East Aglia kwuru. O kwukwara ""O doro anya na ọ gaghị anọte aka n'ogologo ndụ"". Ọ bụrụ na mgbochi ahụ mmadụ esichaghị ike n'ebe ọrịa Sars nọ, ọ gaghị ejide onye ahụ etu o si jide ya n'oge mbụ ọ rịara ya. E nweela akụkọ ndị butere coronavirus karịa otu ugboro n'etiti oge na-adịghị anya. Ụfọdụ sị na ndị mmadụ na-ebuta ọrịa a ugboro abụọ. Ebe ndị ọzọ sị na ọ na-ezo n'ime ahụ mmadụ ruo mgbe ọ ga-apụta ihe ọzọ. Mana nyocha Sayensị kwenyere na ọ bụ nsogbu emeghi nyocha nke ọma mere e ji agwa ndị mmadụ na o buzighi ọrịa ọzọ. Enwebeghi mmadụ amaụma bunye ọrịa a ugboro abụọ iji nyocha ikike nchekwa ahụ ya kama ọ gwụla enwe abụọ. Mana nyocha ziri na ha egosighi njirimara ọrịa a n'obere oge ha butere ya nke ugboro abụọ. Nke a abụghị owuweanya na mmadụ agaghị ebute ọrịa a, ya mere otu World Health Organisation ji gbarụọ ihu nye mba ndị ji akwụkwọ a kpọrọ 'Immunity Passports' na-ebuli mmachi ngagharị na mba ha. Atụmatụ bụ na ọ bụrụ ime nke ọma nq nyocha akụrụngwa mgbochi, I nwereike ịlaghachị n'ọrụ. Nke bara uru nye ndị ọrụ ahụike na-ezutekarị ndị na-egosi njirimara ọrịa n'ebe o buru ibu. Akụrụngwa mgbochi dị mmadụ n'ahụ dị icheiche, ndị a na-akpọ 'Neutralizing antibodies' bụ ndị na-akpagbu ọrịa ahụ ka ọ ghara imetu mpaghara ahụ ndị ọzọ. Nyocha e mere mmadụ 175 gbakere na Chaịna gosiri na pesentị 35 n'ime ha nwere 'neutralizing antibodies' n'ogogo obere. Ya mere World Health Organisation ji sị na akụrụngwa ' Adaptive Immune' nwereike dị oke mkpa na mmadụ ịgbake n'ọrịa a. Ihe ọzọ bụ na-agbanyeghi na i nwereike nwe nchekwa n'ebe ọrịa a nọ kama ọ pụtaghị na i nweghi ike ibu ya n'ahụ gị ma bufee ya onye ọzọ. Nchekwa ahụ dị mkpa n'ụzọ dị icheiche, ma ị ga-ebute ọrịa Covid-19 karịa otu ugboro nakwa oge ole ọ ga-ewe. Nchekwa ahụ a na-emetụta ụdịrị ike ọrịa ga-akpa n'ahụ. Ọ bụrụ na i nwere ya na-agbanyeghi nwa obere, ọ ga-ebelata ụdị ikike ọrịa a n'ahụ gị. Ị ghọta ọnọdụ nchekwa ahụ ga-enye aka ibuli mmachi ngagharị, nke bụ na a ga-ama ụdịrị ndị ọrịa a ga-emetụta karịa nakwa ndị nwereike ikesa ya. Ọ bụrụ na o sie ike imepụta nchekwa ga-anọte aka, ọ ga-enyekwa nsogbu ịrụpụta ọgwụ. Maọbụ gbanwee etu a ga-esi ṅụọ ọgwụ ahụ - ọ ga-abụ otu ugboro na ndụ kaọbụ otu ugboro kwa afọ? Ogologo oge nchekwa ahụ ga-anọ, ga-agwa anyị etu e nwereike iji gbochie mfesasị nje a. Ihe ndị a bụ ajụjụ ndị gbara ọkpụrụkpụ anyị na-ajụ, nke a na-enwetebeghi ọsịsa ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52454724 +politics Samia Suluhu Hassan: Ihe ndị i kwesịrị ịma maka onyeisiala nwaanyị mbu na Tanzania "Na mgbede Wenezde, ka ọ gwara ndị Tanzania na Onyeisiala ha anwụọla, na ụbọchị Tọzde ka e duru ya iyi ọrụ dịka Samia Suluhu Hasssan dịka Onyeisiala mba ahụ. Hassan sobu Magufuli zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2015 dịka osote ya, ha merịkwara ọzọ n'afọ 2020, ebe ọ ga-achịtọpụ afọ ole fọ®ọ n'afọ ise nke ọchịchị ha. Ọ ga-abụ naanị nwaanyị bụ onyeisiala ugbua,(nwaanyị bụ isi nke mba Ethiopia bụ naanị n'aha), ma soro n'otu n'ime ụmụnwaanyị ole na ole n'Afrịka rutere na nnukwu ọkwa a. Nwaanyị ahụ dị afọ 61 bụ onye ndị hụrụ ya na-nya na-akpọ ya, ""MamaSamia"". Ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya oge a họrọ ya dịka onye ga-eso Magufuli zọọ ọkwa n'afọ 2015, gbahapụcha ndị ka ya nwee agba na pati ha bụ Chama Cha Mapinduzi (CCM), patị ahụ anọọrọla n'ụdị di iche iche kemgbe ha nwere onwe ha n'afọ 1961. Hassan banyere ọkwa ọchịchị mbụ ya n'afọ 2000, mana ọ maliere wube ewu n'afọ 2014 dịka osote onyeisi ọgbakọ wepụtara Iwu ọhụrụ ala ahụ. Ebe ahụ o jiri obi dara jụụ na-eso ọgbaghara dapụtachara marakwa ụzọ o si adatu obi ndị n'ekwupụtaka uche ha dị. Ndu Hassan dịka onye nkịtị A mụrụ ya n'ọnwa Jenụwarị afọ 1960 na Zanziba, dị na Tanzania. Ọ gụrụ ""Public administration', na Tanzania ma gaa n'iru gụkwa ya na Manchester University dị na mba Briten. N'afọ 1978, ọ lụrụ Hafidh Ameir, bụ onye a ma dịka onye nkuzi mahadum na-akụzi gbasara ọrụụgbo mana ọ naghị achọ ka a nụ ụda aha ya. Kemgbe Samia bụrụ Osote Onyeisiala, a hụbeghị ebe ya na nwunye ya sere foto. Ha mụrụ anọ nke otu n'ime ha bụ Mwanu Hafidh Ameir, bụ onye ụlọnnochite anya Zanzibar ugbua. Anya niile awụkwasala Osote Onyeisila mba Tanzania, bụ Samia Suluhu Hassan, dịka onyeisiala mba ahụ bụ John Magufuli nwụrụ n'ụbọchị Wenesde dịka o nwechara gbalụgbalụ ọria obi n'otu ụlọ ọgwụ dị na Dar es Salaam. Nke a gbakwasara ụkwụ kpọkwem n'akwụkwọ iwu mba Tanzania, a ga-edu Odoziakụ Hassan n'iyi dịka onyeisiala ọhụrụ mba Tanzania ga-achapụcha oge ọkwa ọchichi fọrọ afọ nke Magufuli nwere afọ ise bidoro n'afọ gara aga. ""Ebe enwere oghere n'ọkwa ọchichi onyeisila nihi ọnwụ, aga edu n'iyi ọrọ osote Onyeisla dika ọga abụ onyeisiala ruo mgbe oge ọchịchị afọ ise nke oche ọchịchị a fọrọ afọ"" bụ ihe akwụkwọ iwu mba Tanzania kpuhere. E duo nwaanyị a n'iyi ọrụ, ọ g- abụ nwaanyị mbụ bụrụ onyeisiala mba ahụ ma bụrụkwa nwaanyị nọọrọ n'oche ọchichi onyeisiala na mpagara Ọwụwa Anyanwụ Afrịka." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56439472 +politics Victor Umeh: Lee ihe ndị ọchịchị anyị kwesịrị ime ka udo na ọganihu bata Naijirịa Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo mere Maazị Victor Umeh bụbu onyeisi patị All Progressives Grand Alliance (APGA) kwuru maka mkamkpa niile na-akpa na Naịjirịa ugbua ọkachasị etu o siri metụta agbụrụ ndị na-achọ oke ha. O kwukwara etu gọọmentị Naịjirịa ga-esi kwụsị mkpamkpa a niile. Gee ntị n'okwu ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-57722157 +politics Nigeria Election 2019: Onyeisiala Buhari na-arịọ ka enyekwuo ya obere oge "Akụkọ dị mkpa: Ihe Buhari chọrọ ka ọ gbara afọ 76 Onyeisiala Muhammadu Buhari arịọla ndị Naịjirịa ka ha ""do do do"" nyekwuo ya nwantịntị oge iji mejuputa nkwa o kwere ndị mmadụ. Buhari kwuru nke a mgbe ọ na-eme emume ncheta afọ iri asaa na isii (76) ya. Ụlọikpe ukwu dị n'Ọshụn steeti atụọla onye bụbu onye ọkammụta na Mahadum Obafemi Awolowo bụ Richard Akindele, nga afọ abụọ. Cheta na Richard Akindele rịọrịọ nwa akwụkwọ ya bụ Monica Osagie ka o nyetu ya ihe ya ka o were bulie ya n'ule akwụkwọ. Gụọ ya n'uju ebe a: Onyenkuzi OAU chọrọ idina nwata akwụkwọ ga-aracha nga afọ abụọ Mba Amerịka awakpoola Al-Shabab na Somalịa Ka a na-ekwu nke a na-ekwu o, ndị agha ụgbọelu mba Amerịka sị na ha egbuola ndị omekataraihepụụjọ dị iri isii na abụọ (62), bụ ndị otu Al-Shabab na mwakpo ọhụrụ ha mere na Somalịa. Mba Amerịka malitere ime mwakpo kpụ ọkụ n'ọnụ kemgbe onyeisiala Donald Trump bara n'ọchịchị. Ewepụtala ka aga-esi gbaa Champions League Ebiputala aha ndị ga-ezute ibe ka asọmpi Champions League na-abanye agba nke iri na isii (16). Liverpool ga-ezute Bayern Munich, Man Utd ga-ezute PSG, Man City ga-ezute Schalke, Tottenham ga-ezute Borussia Dortmund, Real Madrid ga-ezute Ajax. Barcelona ga-ezute Lyon, Juventus ga-ezute Atletico Madrid ebe Roma ga-ezute Porto. Gee akụkọ BBC na nkeji Boko Haram awakpoola obodo ọzọ Ndị Boko Haram wakporo otu ime obodo dị nsọ na Maịduguri, isi obodo Borno steeti ụnyaahụ. Ndị omekaome a gbara ọtụtụ ụlọ ọkụ ma chụsasịa ndị bi na ya bụ obodo akpọrọ Maiborti. Ndị agha Naịjirịa sị na ha zigara ndị agha ma ụgbọelụ ka ha chụpụ ndị oyi egwu n'obodo ahụ. Nke a na-eme ka ozi pụtara na Boko Haram gburu ndị agha iri na abụọ ụbọchị Fraịde n'obodo Gudumali dịkwa na Borno steeti. Ndị gbara ama mwakpo Gudumali kwukwara na ọtụtụ ndị agha ka na-efu. Nwodo sị ka gọọmenti nye ndi Igbo ohere ruru ha Onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ Nnịa Nwodo adọla gọọmentị naịjirịa aka na ntị ka ọ kwụsị imegbu ndị Igbo Nwodo kwuru nke a n'emume Igbo Day emere n'Akure, isi obodo Ondo steeti. Na nkọwa ya, Nwodo sị na ndị kwesiri inwe ohere dịka ndị naijirịa ọzọ ebe ọbụla ha nwetere onwe ha na Naịjirịa. N'ofesi, Mba Saudi Arabia akatọla mba Amerịka maka mkpebi o mere ịta nwa eze Mohamed Bin Salman, maka ogbugbu onye ntaakụkọ Jamal Khashoggi. Ndị Saudi sị na ozighiezi etu ndị omeiwu Amerịka jiri na-ebo Bin Salman ebubo a, ma kwukwa na anya na-acha ha ọbara ọbara maka mkpebi ha banyere agha Saudi Arabia na-ebuso mba Yemen. N'asọmpị Premier league Nwa afọ Naịjirịa Alex Iwobi ekwuola na ọ bụ etinyeghị uche mere eji merie otu ya bụ Arsenal n'asọmpị ha na Southhampton gbara ụnyaahụ. Iwobi sị na ndị Southampton gbara ọfụma, mana Arsenal achịkọtaghị obi ọnụ, nke mere ha ejighi rite mmeri na asọmpị ahu eji ọkpụ goolụ ato ha asatara abụo merịe ha. Ihe nkiri taa:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-46589861 +sports Champions League group stage draw: Onye ga-adabanye n'ọnụ agụ na nke afọ a? "Dịka a ga-ahọpụtara ndị a ga-enye nturuugo maka etu ha si gbaa n'afọ gara aga, a họpụtala ndị ga-ezute ibe nagba nke mbụ na nke afọ a. Ndị dịka Manchester City na Shaktar Donetsk zutekwara ọzọ n'afọ a, dịka ha zutere n'afọ gara aga, ebe Liverpool na Napoli zutekwara onwe ha ọzọ. A họpụtara Virgil Van Dijk dịka nwoke kacha gbaa n'asọmpi Champions League nke afọ 2018/2019. Ọ gbawara Lionel Messi na Cristiano Ronaldo etitkọtara ha atọ aka, napụ ha ihe nrite nke a. N'otu A PSG REAL MADRID CLUB BRUGGE GALATASARAY N'otu B BAYERN MUNICH TOTTENHAM OLYMPIAKOS CREVNA ZVEZDA N'otu C MANCHESTER CITY SHAKTAR DONETSK DINAMO ZAGREB ATALANTA FC N'otu D JUVENTUS ATHLETICO MADRID BAYER LEVERKUSEN LOKOMOTIV MOSCOW N'otu E LIVERPOOL NAPOLI FC SALZBURG GENK N'otu F BARCELONA BORUSSIA DORTMUND INTER MILAN SLAVIA PRAHA N'otu G ZENIT ST PETERSBURG BENFICA OLYMPIQUE LYONNAISE RB LEIPZIG N'otu H CHELSEA AJAX VALENCIA LILLE A họpụtara Lionel Messi dịka ọkacha agba n'ihu nke asọmpi Champions League nke afọ 2018/2019. A họpụtara Frenkie De Jong nke Ajax dịka onye egwu etiti kacha gbaa n'afọ 2018/2019. A họpụtara Virgil Van Dijk nke Liverpool dịka oji azụ kacha gbaa n'afọ 2018/2019. A họpụtara Alisson Becker bụ oche goolu nke Liverpool dịka ""aka kacha chee goolu na Champions League 2018/2019"". Ndị na-akwado Chelsea, Tottenham, Liverpool, Manchester City, Real Madrid, Barcelona, Juventus nakwa otu egwuregwu ndị ọzọ chị obi n'aka. Ha nọ na-eche ịnụ otu ebe ha ga-adabanye ma a malite nhọpụta otu ndị ga-anọ n'agba nke mbụ nke Champions League nke afọ 2019/2020. Otu ndị ọzọ dịka Bayern Munich, Juventus, Borussia Dortmund, Atletico Madrid nakwa Paris Saint Germain (PSG), bụkwa kpọkịrịkpọ ndị nwereike inye ndị mmadụ ọbara mgbalielu. Ndị nwere agba dịka Cristiano Ronaldo, Lionel Messi nakwa Virgil Van Dijk bụ ndị a họpụtara maka inye nturuugo, wụchikwara ebe ahụ. Emume a mere na Monaco dị na mba Frans. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49514772 +entertainment Ignaz Semmelweis: Ihe asaa ị maghị maka nwoke chọpụtara ịkwọ aka Ụbọchị Fraide, Ụlọọrụ 'Google' chetara Ignaz Semmelweis n'ụzọ pụrụiche site n'iji foto ya e sere ese mee ihu ọba ozi ha iji kwanyere ya ugwu maka ịchọpụta uru ịkwọ aka bara n'ibelata nkesa ọrịa. Lee ihe ndị mere Ignaz Semmelweis oyoyo ị na-amaghị: 1. Ọ bụ onye dọkịta chọpụtara na e nwereike site n'ịkwọ aka belata ọrịa ahụọkụ na-egbụkarị ụmụnwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ n'oge agba afọ 1800 na 1820, oge ụmụnwaanyị na-anwụ ka ọkụkọ n'ịmụ nwa. 2. Semmelweis gwara ndị dọkịta ka ha bido ịkwọ aka tupu ha a naa nwaanyị nwa. N'afọ 1847, wọọdụ ya mere ya, ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị nwụrụ n'ịmụ nwa site na pasent 18.3 gbatuo rue pasent 2.2. 3. A mụrụ ya n'obodo Taban dị nso na Buda na Budapest n'afọ 1818. 4. Mana ndị dọkịta ibe ya kwara ya emo maka nchọpụta ya ma jụ ịgbaso nchọpụta ya n'ihi na ọ gbasoghi usoro ha na-esobu. 5. Ọ na-azubu ahịa tupu ọ lọgachị ụlọakwụkwọ gụọ maka ahụike. 6. Ọjụjụ a jụrụ nchọpụta ya mere ya butere ya obi ịda mba dịka ọ kpọrọ ndị dọkịta agbaso amụma ya 'ndị ọmụma egbu ọchụ', n'ihi na ha na-eji aka e ji naa otu nwaanyị nwa ga naa nwaanyị ọzọ. 7. A tụnyere ya n'ogige a na-elekọta ndị isi mgbaka ebe ọ nọọ nwụọ ka ọ gbachara afọ iri anọ na asaa (47) n'ihi abụ sochiri ihe ndị nche kụrụ ya. 8. Ọ bụ mgbe Semmelweis nwụchara ka ọha jiri were okwu ya kpọrọ ihe ma tinyekwa ya n'ọrụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-51983370 +entertainment Majek Fashek: Etu o si nwụọ na ihe ndị ị na-amaghị maka ya Onye nhazị ọrụ Majek Fashek bụ Omenka Uzoma agwala BBC etu otiegwu ukwu ahụ si nwụọ na mba Amerịka. Gere ihe o kwuru n'uju ebe a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52866557 +entertainment Nsude Pyramid: Igbo nwere 'Pyramid' mgbe gboo Mkpuru Uto bụ nke Bekee kpọrọ Pyramid bụ ebe ndị Igbo na-efe ofufe mgbe gboo. Ọ dị na Nsude, nke dị na Enugwu steeti. Ya bụ Mkpuru Uto dị iri n'ọgụ nke na-egosi obodo iri dị na gburugburu ebe ahụ bụ ndị na-efe chi ha ebe ahụ. Ugbua, naanị ndị na-eme omenala bi na Nsude na-achọ ịmekwata ya. Anya ndị Enugwu steeti Tourism Board dịkwa na-ebe ahụ. Ana atụ anya na ha nwereike iso ndị obodo mee ka ya bụ ebe yie ihe. Lee ihe foro na ya bụ Ugwu Uto. Ndị mere akụkọ a: Chiemela Peters Mgbeahuru na Chris Sanctus Okereke https://www.bbc.com/igbo/afirika-55255879 +health Nutrition: Nri ndị ị kwesịrị iri kwa ụbọchị iji kwụrụ chịm Ka ị na-eri nri kwa ụbọchị, ị ma na e nwere nri ndị dị mkpa ka i na-eri kwa ụbọchị ka ị nwee ike na-anọ n'ezigbo ahụike? Nri ndị a dị mkpa n'imezi ahụ mmadụ site n'ime ahụ pụta n'ezi, mana ọtụtụ ndị amaghị n'ihi na ha na-eri nri naanị ka ha wee dị ndụ karịa iri nri maka ndozi ahụ na ezi ahụike. Ọtụtụ n'ime ha bụ ngwanri ndị ị ma nakwa na-ahụ oge niile, mana ị maghị etu ị ga-esi tikọta ya wee rie ya ka ọ rụọ gị ọrụ n'ahụ. Nri ndị a na-enye ihe dị iche iche n'ahụ gụnyere Vaịtamin, abụba na mmanụ, mgbadoume, mịneralụ, odozi ahụ nakwa ihe ndị ọzọ dị iche iche. 1) Mkpụrụosisi: Ndị ọkachamara n'ihe gbasara nri na ihe ọ na-enye n'ahụ ekwuola na mkpụrụosisi dị mma n'ahụ maka ụdịrị ọrụ ọ na-arụ. Mkpụrụosisi nwere ihe Bekee na-akpọ 'fiber' nke na-enyere aka ịgbari nri n'ahụ ma mee ka nri nwee ike igazu gburugburu ahụ mmadụ. Ha nwekwara shuga nke ha, nke bụ na ọ bụrụ na ị na-asọ shuga, ị nwereike itinye mkpụrụosisi na nri gị were ya mere shuga ị ga-eji rifee nri gị. Ma o kweghi gị aracha maọbụ ata, ị nwereike ịkwọ mkpụrụosisi gị akwọ ṅụfee ya ka mmiri. Mkpụrụosisi gụnyere unere, oroma, akị, ube, mangoro, oroma nkịrịsị, icheku wdgz. 2) Akwụkwọ nri: Nke a bụ otu ụzọ nri i nwereike iji rijuo afọ ma na-erighi oke nri. Ndị Igbo nwere ọtụtụ akwụkwọ nri dị iche iche nke a na-eji esi ofe nakwa nri ndị ọzọ. Mana ị ma na ọ bụghị oge niile ka ị kwesịrị isi akwụkwọ nri gị n'ọkụ? Ụfọdụ akwụkwọ nri na-adị mma ka o ghara ide ede, ka ihe ndị ọ na-eji edozi ahụ nke Bekee kpọrọ 'nutrients' nwee ike ka ju n'ime ya mgbe mmadụ na-eri ya. Akwụkwọ nri gụnyere ụgụ, ụzịza, onugbu, ọkazị, ụtazị, tomanto, ndukwu, karọt, wdgz Ero, ọka nakwa ụfọdụ agwa bụkwa ụdịrị akwụkwọ nri. 3) Odozi ahụ (Protein) Nke a so n'ụdịrị nri kacha mkpa ka mmadụ na-eri kwa ụbọchị. Ọ dị mma iri maka ndozi akwara nakwa ngagharị ihe dị n'ime ahụ; ọ na-enyekwa aka ime ka mmadụ rijuo afọ. Odozi ahụ gụnyere mmiri ara ehi, ụdịrị azụ dị iche iche, nshịkọ, ịsha, anụ dị iche iche, akwa, nakwa mkpụrụ gụnyere kashu, ahụekere wdgz. 4) Mkpụrụ: Mgbadoume nke Bekee kpọrọ 'carbohydrate' abụchaghị ihe ọjọọ dịka ụfọdụ ndị na-ekwukarị. Ụfọdụ na-enye aka n'idozi ahụ, ọkachasị ndị nke nwere 'fiber' ahụ, n'ihi na ha na-ejide gị ka mgbadoume, mee ka agụụ ghara ịgụ gị ọsịsọ. Ụfọdụ mkpụrụ dị mma iri gụnyere achịcha e ji nke Bekee kpọrọ 'whole wheat' mee, osikapa na-acha aja aja, 'oat', 'whole-wheat pasta', quinoa, soyabean wdgz. 5) Nri si na mmiri ara ehi: A na-esi na mmiri ara ehi emepụta ihe dị iche iche na-edozi ahụ. Ụfọdụ na-abịa dịka abụba ebe ndị nke ọzọ na-abịa dịka odozi ahụ; nke na-eme ka afọ ju gị mgbe i richara nri, kama e kwesịghị iribiga ya oke. Nri ndị si na mmiri ara ehi gụnyere yogọtụ, chiiz, bọta wdgz. Na nchịkọta, nri mmadụ na-eri kwa ụbọchị kwesịrị ịgụnye ọbụlagodi otu ihe n'ime ụzọ nri ise ndị a (ya bụ họrọ otu ihe otu ihe n'ime ụzọ nri ise a jiri mejuputa nri gị kwa ụbọchị). Irikọta ha ọnụ kwa ụbọchị ga-enye aka ibelata ụjọ ọrịa obi, site n'ime ka mmadụ ghara inwe ọbara mgbalielu nakwa nnukwu kọlesterọl, dịka ngalaba NHS nke mba Briten si kwuo. https://www.bbc.com/igbo/afirika-55966778 +politics Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Trump na Kim ezutela na Singapore Akụkọ kachasị mere taa; Humphrey Nwosu bụ onye haziri ntuliaka nke afọ 1993 nke họpụtara MKO Abiola dịka onyeisiala, ekwuola na ọ gaghị azanwu oku gọọmentị kpọrọ ya maka ikwanyere Abiola na ndị ọzọ ugwu. Nwosu kelere gọọmentị maka nkwanye ugwu a, ma kwuo na ya agaghị abịanwu emume nke e hibere taa, maka na ọ nọ na mba ofesi. Peter Obi bụ onye chịburu Anambra steeti etoola Onyeisiala Muhammadu Buhari maka ime ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Juun ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya. Obi kwuru na ọ bụ ohere iji mezie ihe ndị mebirila na Naịjirịa nakwa imezi ihe na ndụ ndị ọzọ Juun 12 a metụtara dịka Humphrey Nwosu, Ralph Obioha nakwa Dan Suleiman. Akụkọ mba ofesi; Onye isiala mba Amerịka bụ Donald Trump na nke Nọt Koria bụ Kim Jong-Un ezutela ma kelee onwe ha na Singapore. N'ime nzukọ a, ha binyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịta, ebe Kim kwuru na ha ekpebiela ịhapụ ihe ndị mere n'oge gara aga. Ndị otu Super Falcons wụrụ ndị Queen Scorpions nke Gambia ọkpụ isii asataghị otu ka ha na zutere na Lagọs maka ịmata onye ga-etozu isonye n'asọmpi iko mba Afrịka nke ụmụnwaanyị. Desire Oparanozie nyere ọkpụ goolu anọ, ebe Asisat Oshoala nyere abụọ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-44449831 +politics Imo state: Etu Ekeresimesi n'ọchịchị Ihedioha si dị iche na nke Rochas N'ime ihe nkiri a, ndị Imo steeti na-ekwu ihe di iche n'Ekeresimesi n'oge ọchịchị Rochas Okorocha na n'oge nke Chukwuemeka Ihedioha na-achị ugbua. Ha kwuru na ọchịchị Okorocha ka nke Ihedioha akpọtụ akpọtụ. Mana ụfọdụ n'ime ha kwuru na nke Ihedioha akpọtughị n'ihi na ọ ka na-achọ iruzi ihe ndị mebiri emebi. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50950624 +religion Notre Dame Cathedral: Ọkụ agbaala nnukwu ụlọụka Notre Dame "Akụkọ chara akwụ taa: Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ọkụ amabeghị ihe butere ya enwurula n'ụlọụka Notre Dame Catheral dị na Paris, mba France. Ndị ọrụ gọọmenti na-ekwu na o nwere ike ọ bụrụna ọrụ e ji n'aka ugbua n'ụlọụka ahụ kpatara ọkụ ahụ . N'afọ gara aga, ụka Katọlik kporo oku ego iji were ruzie ụlọụka ahụ nke na-adakpọ adakpọ. Otu ọnụ na-ekwuru ụlọụka ahụ bụ nke Katọlik kwuru na ihe niile na-agba ọkụ, o nweghị ihe ga-afọ."" Dịka ozi si n'ụlọrụ onyeisiala mba Francce pụta siri kwuo, onyeisiala ha bụ Emmanuel Macron agbahapụla ebe o kwesịrị ịga gawa ebe ihe mere. A na-arụzigharị Notre Dame Cathedral nke nde kwuru nde ndị njem nleta na-aga ahụ kwa afọ kemgbe a chọpụtara na o nwere akụkụ ya gbawara agbawa. Ozubulu massacre:Ụlọikpe atọhapụla mmadụ abụọ so na ndị anwụchiri Ka anyị malite n'Anambara ebe ụlọikpe ukwu dị n'Awka tọhapụrụ mmadụ abụọ eboro ebubo na aka ha dị na ọchụ ahụ e gburu na St. Phillip Catholic Church Ozubulu. Okaikpe ukwu bụ Jọstis Fidelis Aniukwu kwuru na ya ahụghị ihe gosiri na aka Chinedu Akpunonu na Onyebuchi Mbanefo dị na ya ọchụ e gburu na ụbọchị isii nke ọnwa August afọ 2017. Onyeisi ndị uweojii n'Enugu adọọla ndị ọgbatumtum aka na ntị maka ịda iwu etiri gbasara ịgba ọgbatumtum. Ọzọ dịka ibe ya, cheta na mmachị ọgbatumtum ịgba ga-dị n'Enugwu steeti. Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Sulaiman Balarabe enyela ndị uweojii iwu ka ha nwụchie ndị na ada iwu ahụ ma kpachie ọgbatumtum ha ma kpụpụ ha ụlọikpe. N'ofesi e, okeide mmiri sitere na oke mmiri zoro ụbọchị ụka na mba Ghana egbuola mmadụ ise ka ya bụ mmiri zochara naanị awa atọ. Seji Saji bụ osote onye isiọrụ National Disaster Management Organisation gwara BBC nke a mgbe anyị gbara ya ajụjụ ọnụ. N'egwuruegwu, Manchester United akpọpụtala aha dike na dimkpa iri abụọ na abụọ bụ ndị ga-eso sọọ mpi Champions League ha na Barcelona ụbọchị Tuzde na-abịa. Cheta na Barcelona ji otu ọkpụ nyụọ Manchester anya mgbe ha gbara nke agba nke mbụ. Nke mere ya iko mbụ na-abata ya aka kemgbe afọ 2008. Onweghị tinye maọbu mwepụ ego n'abịa na mmanụ agbịdị Gọọmentị Naịjirịa sị gị dere juu makana ha ekpebibeghị ịwepụ atụmatụ Bekee kpọrọ fuel subsidy. Gọọmentị sị na onweghị ihe ọbụla na-eme ga-akpata ka ewepụ ya ugbua. Mmadụ iri na abụọ nwụrụ ebe mmadụ iri na isii merụrụ ezigbote ahụ n'ihe mberede a. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Gombe bụ Mary Mallum sị na ọ bụ wa wa wa butere ihe mberede okporo ụzọ a. Ndi agha napụrụ Omar al-Bashir ọkwa na mba Sudan amalitela ịnwụchịkọ ndị ya na ya so chịa mba ahụ. Ndị agha Sundan mere nke a ka ha ka na-ekwekwa nkwa na ha agaghị achụpụ ndi na-eme ngaghari iwe na mba ahụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-47932881 +health Marburg virus: Ihe ị kwesiri ịma maka nje a gburula mmadụ abụọ "Mba Gana ezigala mmadụ iri itolu na asatọ ka ha nọpụrụ onwe ha iche dịka a na-eche na ha nwereike ibu ọrịa nje Marburg. Cheta na enyochapụtara nje ọrịa a n’ahụ mmadụ abụọ na mba ahụ.\nE kwuru na mmadụ abụọ anwụọla n’ebe mpaghara Ashanti dịka ọrịa ọhụrụ a malitere mfesawa n’akụkụ ụwa dị ịcheịche na nso nso a . Dịka ngalaba ahụike mbaụwa bụ WHO kwupụtara na nje 'Marburg' egbuola mmadụ abụọ a, egwu na-atụ na ya bụ nje na-efe nwere ike ịbata Naijiria ma ọbụburu na ndị mmadụ na gọọmentị ejikereghị gbobido ya. Akụkọ kwuru na nke a mere na mpaghara a kpọrọ Ashanti dị n'akụkụ ndida mba ahụ Nchọpụta mbụ WHO mere gosiri na ndị ahụ nwere ịba dị ezigbo njọ nakwa ịnyụ pịrị pịrị bụ njirimara abụọ ọrịa ahụ. Dịka dọkịta ahụike ọha bụ Dkta Bayo Onajole siri kọwara BBC Igbo, na nje 'Marburg' so na nje ndị na-akpa ike dịka 'Yellow fever', ebola, 'Lassa fever', na-emebi ihe n'ọbara nke Bekee kpọrọ 'haemorgining fever'"". Onajole onye bụ onyeisi ngalaba ahụike obodo na College of Medicine, University of Lagos sị: ""Njirimara ọrịa ndị a nke na-eyi onwe ha gụnyere ahụ ọkụ, ahụ mgbu na ịgba ọbara."" Ihe ọzọ WHO kwukwara bụ na ọrịa na-anọ site n'ụbọchị abụọ rue ụbọchị iri abụo na otu n'ime ahụ mmadụ tupu o malite ịgosi. Cheta na a chọtabuola ọrịa a na mba Gini n'afọ 2021 mgbe o gburu ụfọdụ mmadụ ma na-efesi kwa ike. Dịka ngalaba WHO si kwuo , Marburg bụ ọrịa na-emesi mmadụ ike. Ọ na-emekwa ka onye bu ya gbaa oke ọbara nakwa ịba. Ha sị na nje na-akpaso ya so n'otu ezinaụlọ nje ndị na-ebute ọrịa Ebola. Aha ya si n'otu obodo a kpọrọ 'Marburg' na mba Jamini bụ otu n'ime obodo abụọ gụnyere Frankfurt bụ ebe ọrịa ahụ fesiri ike n'afọ 1967. Ha kwuru na a na-ebute ya site na mmiri ọbụla si mmadụ bu ọrịa ahụ n'ahụ apụta gụnyere ọsụsọ, asọ mmiri, ọbara na mmri ahụ mmadụ ndị ọzọ. O sikwa na mmiri ahụ anụmanụ ọbụla bu ọrịa ahụ apụta ọ kachasị ụsụ na enwe. Njirimara ọrịa 'Marburg' Dika Dkta Onajole siri kọwaa, ụzọ kacha mma igbochi ọrịa Marburg bụ site;" https://www.bbc.com/igbo/articles/c3g0yn28w9no +politics Lee ihe gbanwere n'otu afọ kemgbe Taliban weghara ọchịchị n'Afghanistan "O ruola otu afọ kemgbe otu Taliban weghara ọchịchị na mba Afghanistan dịka onyeisiala mba ahụ bụ Ashraf Ghani gbapụrụ n'obodo ahụ. Ghani na ezinaụlọ ya gbagara mba Abu Dhabi dịka o kwuru na 'Taliban emeriela"". Nke a bụ mbido mgbanwe dị icheiche site na ndị mbịarambịara nakwa ndị mba ahụ malitere ịgbaga ọdọ ụgbọelu dị na mba ahụ ma na agbapụ. Mba dị icheiche gụnyere Briten, Amerịka nakwa Fransị malitekwara ịbupu ndị be ha nọ ebe ahụ. Dịka taa mere ya otu afọ kpọm kwem, anyị na-eleghachi anya n'etu ihe si kwụrụ n'obodo ahụ nakwa mgbanwe dị ya. Nchọpụta BBC mere site n'ịgba ụmụnwaanyị bi ebe ahụ ajụjụ ọnụ gosiri na ọ b ụ ha ka ọchịchị ahụ kachasị metụta. Otu onye achọghị ka akpọọ aha ya kọwara na achụrụ ya n'ọrụ ma sị ya gwa ndị nwoke ọ ma dịka nwanne ya nwoke maọbụ di ya bịa tinye akwụkwọ ọrụ ahụ. ""A gbara m mbọ ịnweta ọrụ m site n'agụmakwụkwọ...anyị nabata nke a, ọ pụtara na anyị arapụtala onwe anyị"". O so na ọtụtụ ụmụnwaanyị achụrụ n'ọrụ na ngwụcha ọnwa Ọgọst afọ 2021 mgbe Taliban banyechara n'ọchịchị. N'aka nke ha, otu Taliban na-ekwu na ụmụ nwaanyị ka na-arụ ọrụ na mba ahụ mana ọ bụ karị ọrụ ahụike, ọrụ nkuzi nakwa ọrụ nchekwa ebe ụmụ nwaanyị na-anọklarị ka ha na-arụ. Ha kwukwara na aka na-akwụ ụmụ nwaanyị ahụ ụgwọ ọrụ mana o zughizi ezu dịka ha na-erite bu mbụ. Agụmakwụkwọ: Akwụsịrị ụmụ nwaanyị ịgụ akwụkwọ n'ebe ahụ Mmnwereonwe: Ha kpachịrị ikike mnwereonwe ndị mmadụ ọ kachasị ụmụnwaanyị ndị ha kwụsịrị ịme ngagharịiwe nsonso a Okpukperechi: Ha hibere otu ọ bụ ọrụ ha ịhazi ejiji ụmụnwaanyị ma mee ka ha kpuchie ihu na isi ha. Ọrụ: Nnyocha otu akpọrọ International Labor Organization mere gosiri na ọnụọgụgụ ụmụ nwaanyị nwere ọrụ ejirila pasentị iri na isii datuo na mba ahụ." https://www.bbc.com/igbo/articles/c0wn2znrw0yo +health Coronavirus update: Gọọmentị Naijiria eji coronavirus ebupu ego? Gọọmentị Naijiria eji coronavirus ebupu ego? Gbazie anya ka ị hụ na-ejighị akụkọ ụgha duhie gị. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Chimezie Ucheagbo https://www.bbc.com/igbo/52683265 +business EFCC anwụchiela ndị Swiss Golden maka igwu ndị mmadụ Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a: Swiss Golden eruola njedebe EFCC anatala ihe ruru naira nde narị abụọ na iri n'isii bụ ego ndị Swiss Golden ghọgbutere n'aka ụmụ mmadụ Ha nwụchikwara ndị Naịjiria abụọ na otu onye Rọshịa na Lagos ma buru ha ga ba Kano maka nyocha zuru oke. Dọkịta adigboroja na Legos Ndị uweoji nwuchiri otu nwoke bụ dọkịta adịboroja na-edenye ndị mmadụ ọgwụ na Legos. Nwoke ahụ bụ onye Borno steeti agụchaghị ụlọakwụkwọ Primarị. Ndị uweojii sị na ha ga-akpụpụ ya ụlọikpe. Ndi nọchitere anya Naịjirịa n'asọmpi egwuregwu Commonwealth emere na mba Australia, ga-alọghachite Naịjirịa n'ụtụtụ echi. Ha ji ihe nrịta dị icheiche ruru iri abụọ na anọ alọta. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Facebook a ga-aga ụlọịkpe ọzọ? Otu onye ọkaikpe n'obodo California ekpebiela ka Facebook ga-aga ụlọikpe maka ịjị teknụzụ a kpọrọ 'Facial Recognition' achọkọta akụkọ gbasara ndị mmadụ n'agwaghị ha Facebook ekwuola na ha jụrụ nke a jụ ma na-ekwu n'onweghị iwu ha dara. Nkeji ụtụtụ a: Gere akụkọ nke ụtụtụ a: Ihe nkịrị nke taa Ihe onyonyo a gosiri ebe onye ọkpaọchị , Josh2funny, na-akọwa akaọrụ ya https://www.bbc.com/igbo/afirika-43794241 +entertainment Burna Boy agbaala n'ihe emume Trevor Noah "Burna Boy agbaala n'ihe emume Trevor Noah bụ nwa afọ Saut-Afrika bụ ọkpaọchị a ma ama na mba Amerịka. Nke mere ụmụ Naijiria jiri kpụrụ ya na Trevor n'ọnụ. Burna Boy, onye gụrụ egwu ya a kpọrọ ""ye"" nakwa ""Anybody"" n'ihe emume Noah gosiri na ọ bụ ezigbo nwa Naijirịa ka ọ wuchiri. Ka nwa amaadị a ritere nzere ""BET international act afọ 2019' na Trevour kelechara, ihe pụrụ ya n'ọnụ bụ ""How una dey now?"" Ọ kọọkwara Noah etu ya siri zute ya mbụ na Saut Afrika n'afọ 2014. ""Anyị na-achọ ịbanye, ebe Trevour na-achọ ịpụta. Ndị mmadụ na-eti ""Trevor! Trevor"" Nwaanyị m na ya so gaa jụrụ biko a chọrọ m ị ga-kelee Trevour ma agbọja ya, 'nọọ ebe ịnọ."" Akụkọ ya tọrọ Trevor nnukwu ọchị dịka o kwuru na ọ bụrụ ụfọdụ mmadụ, ha ga-eji maka ihe ahụ mere bido kpọwa ya asị. Trevor Noah: Kedụ ihe mere egwu Naijiria nakwa egwu si Afrịka ha ji achake n'ụwa niile ugbua? Burna Boy: Ihe niile na-alaghachi ebe o si. Ọ bụ maka na egwu si n'Afrika bịa, egwu na-alaghachịkwa n'afrịka ebe o si. ""Mgbe ihe niile mebichara, onye ọbụla alawa. Trevor Noah: Ị kpọrọ egwu gị ' Afro fusion' gịnị bụ 'Afrofusion.' Burna Boy: ""Afrobeat dịka 'pizza,ntọala ya bụ 'flour', i nwere ike ifenye ya 'hip-hop' maọbụ 'pepperoni' maọbụ 'dancehall' bụzị ihe ndị a na-etinye ya were nweta ụdị egwu ị chọrọ.""" https://www.bbc.com/igbo/49347423 +politics From Entertainment to Politics: Funke Akindele, Trump, Tonto Dike na ndị ọzọ si n'ịkpa obi ụtọ banye ndọrọndọrọ "Na nsonso a, dịka Funke Akindele na Tonto Dikeh  kwụpụtara mmasị ha ibanye ndọrọndọrọ ọchịchị maka ntuliaka 2023, ọtụtụ ụmụ Naijira ji mkparị chụchụọ ha eze. Akindele so Olajide Adediran nke pati PDP azọ ọkwa Gọvanọ Legọs dịka osote ya, ebe Tonto Dikeh so Tonte Ibraye nke otu ADC azọ ọkwa Gọvanọ Rivas steeti dịka Osote ya. Ụfọdụ kwuru na ụmụnwaanyị abụọ ndị a chere na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ""njakịrị'. Mana ha abụghị ndị mbụ nke ha ga-ab��� ndị ikpeazụ ga-esi n'ịkpa aṅụrị banye n' ọchịchị obodo. Lee ụfọdụ ndị a na-anụ aha ha n'ụwa merela ya: Donald Trump bụ ojiegoachụehgo na onye ihe ejije  banyere na ndọrọndọr ọchịchị ma nweta ọnkwa onyeisiala 45 nke mba Amerịka. Ọ bụ ya bụ onye haziri ma sonyekwa n'ihe onyonyo TV 'The Apprentice"" bụ ebe o mere agwa onye nwe ụlọọrụ. O sonyekwala na ihe ejije ndị ọzọ nakwa na nkwado ịgba mgba  nke WWE kemgbe agbata 1980s. Oge Trump kwupụtara n'ọnwa Juun afọ 2015 na ya chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala, Amerika, ndị  ma ihe ekwe na-akụ n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, eleghị ya anya ugboro abụo. Mana mgbe oge ruru,  Trump mere ihe tụrụ ndị mmadụ n'anya dịka o meriri Hilary Clinton  bụ onye ọtụtụ na-ele anya ga-ewere ọkwa ahụ. Trump bụ onye Amerika mbụ na-aba n'ọkwa onyeisiala na-arụbeghị ọrụ onye agha maọbụ rụọ ọrụ gọọmentị. A ma Desmond Elliot dịka onye ejije  Nollywood na-egosikarị agwa ịhụnanya. Oge ọ pụtara ịzọ ọkwa onyeomeiwu na Legọs steeti, ụfọdụ ụmụ Naijiria kpọrọ ya okwu njakịrị. Mana Igbo si na e lelia nwa ite, ọ gbọnyụọ ọkụ. Ugbua, ọ bụghị naanị na Elliot bụ onye zọrọ ọkwa ịnọchite Surulere n'Ụlọomeiwu Legọs steeti n'aha otu APC meriri na ntuliaka  2015, ọ banyela n'agba nke abụọ ya n'afọ 2019. Arnold Alois Schwarzenegger bụbụ onye na-akpụ ụzụ (body builder) tupu ọ bụrụ onye na-eme ejije. Nwa afọ Austria  a bụkwa onye Amerika a ma n'ihi ihe ejije na-egosi odogwu o merela. Ọ burụ na i toro n'afọ 80s na 90s, ị ga-ama ụfọdụ ejije o mere dịka 'Terminator' , 'Commando', 'Twins' na 'Predator'. Ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya  oge Schwarzenegger wụbara na ndọrọndọrọ ọchịchị. Nwa amadi ahụ a mụrụ n'afọ 1947 bụ gọvanọ California n'aha otu 'Republican Party' malite  n'afo 2003 rue afọ 2011. 'Governator 'dịka e ji mara Schwarzenegger oge ọ nọ n'ọkwa gọvanọ banyere  n'ọkwa ahụ ka e mechara ntuliaka mgbakwụnye e mere iji wepụ Gray Davis bụ onye ọha ndị steeti ahụ si na ha achọghịzi dịka gọvanọ ha n'ihi nsogbu ọkụ latrik na nsogbu so Bọjet California na mbido agba nke abụọ ọchịchị Davis. Ugbua, Schwarzenegger dị afọ 75 nọzị ezumike nka, ya na ụmụanụmanụ ya na-egoli. Nwunye ya bụ Maria Shriver gbara ya arụkwaghị n'afọ 2021 dịka Schwarzenegger kwupụtara na odibo ha nwaanyị mụtara ya nwa. Judith Babirye bụ otiegwu ụka a ma ama na na mba Yuganda. Ọ bụ onye ụkọchukwu ma bụrụkwa  omeiwu n'Ụlọomeiwu mba Yuganda malite n'afọ 20016 rue2021. Kongara Jaggaya bụ onye ihe ejije na onye nta akụkọ mba India a ma ama maka agwa o mere n'ọtụtụ ihe onyonyo karịrị 200 nke gụnyere ""Alluri Sita Rama Raju"", ""Bobbili Simham"". Jaggaya a mụrụ n'afọ 1928 bụ onye ejije mbụ n'India na-abanye n'ụlọomeiwu mba ahụ. Jaggaya nwụrụ n'afọ 2004. Ị ma na onyeisiala mba Liberia ugbua bụbụ ọgbabọọlụ  a ma ama? Nwa amadi a gbara afọ 55( a mụrụ ya n'Oktoba 1, afọ 1966) bụbụ onye egwu bọọlụ wuru ewu n'ụwa dịka o riterela nturuugo  kara aka dị iche iche gụnyere;'Fifa World Player of the Year, 'CAF Award for Best  Ten Players of the Last 50 Years.' Tupu ọ bụrụ onyeisiala, Weah zọrọ  ma nweta ọkwa Senetọ na-anọchite Montseerrado County n'Ụloomeiwu Ukwu mba Liberia. Tupu nke a, Weah  onye hiwere otu Congress for Democtaic Change zọsara Ellen  Sirleaf ọkwa onyeisiala n'afọ 2005 mana ọkwa ahụ eruteghị ya aka. N'afọ 2011, ọ zọrọ dịka osote Winston Tubman mana ọ kwara ya. N'afọ 2014, ọ zọrọ seneto nweta mmeri. n'afọ 2017, ọ zọrọ ọkwa onyeisiala ọzọ, ma merịe Joseph Boakai bụ Osote Onyeisiala oge ahụ, e duo ya iyi ọrụ n'abalị 22 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2018 Ọ bụghị naanị Trump bụ onye nụrụ ọrụ ịkpa obi ụtọ banyerela ọkwa onyeisiala mba Amerịka. Donald Reagan bụ onyeisiala Amerika nke 40 bụbụ onye ihe ejije Hollywood. Ihe ejije o merela gụnyere 'Love is On the Air', 'Dark Victory','Santa Fe Trail'. Ọ malitere ndọrndọrọ ọchịchị dịka Govanọ California  malite n'afọ 1966 rue afọ 1975. O mechara bụrụ onyeisiala n'afọ 1981 rue afọ 1989. Ọ bụrụ na ị mabughị Zelensky, Agha Rushịa na Yukren, emela ya otu onyeisiala a kp u n'ọnụ kemgbe Febụwarị afọ 2021 bụ oge Rọshia wakpro mba ya. Mana Ị ma Zelensky bụbụ ọkpaọchị tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị? Ọ gụrụ  maka iwu (Law) na mahadum mana pute mewe ejije ịkpaọchị dịka ọ malitere ụlọọrụ na-eme ejije a kpọrọ Kvartal 95 bụ ebe o mepụtara ihe onyonyo TV dị iche iche gụnyere nke ọ kpọrọ 'Odibo ndị mmadụ bụ eme o na-eme agwa onyeisiala. malite n'afọ 2015 rue afọ 2019. N'afọ 2018, ndị ọrụ ụlọọrụ Kvartal malitere party ha kpọrọ  'Odibo ndị mmadụ. Zelensky pụtara zọọ ọkwa onyeisiala Yukren n'afọ 2019, merie aka na-achị mba ahụ mgbe ahụ bụ Petro Poroshenko. E ji  iji shosal midia  ọkachasi Instagram agbasa ozi mara Zelensky. Allessandra Mussolino bụ nwanwa Benito Mussolino bụbụ Praim Minista mba Italy malite n'afọ 1922 rue afọ 1945 bụ oge e gburu ya. Ọ bụbụ onye ihe ejije nakwa onye e ji ihu ya ere ahịa tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị. Ihe ejije ndị o sonyere na ya gụnyere 'Ferragosto Ok', 'Vincere per vincere' na 'Ha-Derech L'ein harod' bụ nke ikpeazụ ya o mere n'afọ 1990. Nwaany a lụrụ di ma jide ụmụ atọ bụbụ onye omeiwu ụlọomeiwu ukwu mba Italy (2013-2014) mecha bụrụ onye omeiwu nke  otu EU 'European Parliament'. malite n2014 rue na 2019. Lech Kaczynski gụrụ maka iwu na mahadum 'Warsaw University""na ejima ya sonyere n'ihe Ejije Poland ama dịka "" The Two who stole the Moon."" Ọ bụrụ onye 'senetọ n'afọ 1989,, ọ rụkwara ọrụ dịka Mịnịsta nchekwa na mba ahụ. tupu a chụọ ya n'ọrụ. maka nsogbu dapụtara n'Ọchịchị Jan Olszekwi. N'afọ 2003, Kaczynski na nwanne ya gara malite pati nke ha  a kpọrọ Law and Justice party bụ ebe ọ zọrọ ọkwa onyeisial ma merịe n'afọ 2005. N'afọ 2006, Kaczynski họpụtara ejima ya dịka Praim Minista nke  mere ya mbụ n'ụwa ụmụnne abụọ ịbụ onyeieisla na Praim Minista. N'afọ 2007, ejima Lech dara na ntuliaka, ebe Leech Kaczynski na nwunye ya bụ Maria nwụrụ na mkpọkasị ụgbọelu n'afọ 2010. Gideon Kipsiele Moi bụ onye egwuregwu polo mba Kenya zọrọ ma nweta ọkwa onye omeiwu n'Ụlọomeiwu Ukwu mba Kenya. Kipsiele Moi nọchitere anya mpaghara Baringo n'ụlọomeiwu Ukwu mba Kenya. Jesse Ventura bụ  ọgbamgba  a mabu a ma dịka  ""the Body""n'otu mgba Word Wrestling Federation mechia banye n' ihe ejije na ndọrọndọrọ ọchịchị mba Amerika. Ihe ejije o merela gụnyere ""Predator"", Ventura bụ gọvanọ Minnesota malite n'Afọ 1999 rue afọ 2003 n'aha Reform Party. Ventura onye aha ya bụbụ James George Janos tupu ọ gbanwe ya ji ịgbasa ozi n' ịntanet were dọta ndị ntorobia ike pati abụọ na-achị Amerika gwụrụla ike. Mmeri ya na tuliaka tụrụ ndị mmadụ na anya n'ihi na  na ọ bụ mbụ onye si Reform Party na emere na ntuliaka steeti na Amerika. Ọ na-aga! Naijiria nwere ọtụtụ ndị na-akpa obi ụtọ nwalerela ndọrọndọrọ ọchịchị ma zọọ ọkwa dị iche iche. Mana imirikiti ka a kpọrọ, ole na ole ka a họtara. Ụfọdụ n'ime ndịa ha achịtabeghị aja n'okwu ndị na-ekwu ighe na-eme n'obodo. Ndị dịka ; Kenneth Okonkwu Kenneth Okonkwo zọrọ ọkwa gọvanọ Enugwu steeti n'aha APC n'afọ 2015 mana o nwtaghị ikike pati ahụ ife ọkọlọtọ ha. Yul Edochie Yul Edochie zọrọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti n'afọ 2017 n'aha otu DPC. Banky W Bankole Wellington bụ otiegwu a ma dịka 'Banky W' si n'iti egwu wụba ọrụ ndọrọndọrọ ọchịchị. O malitere iti egwu kemgbe afọ 2002 ma mepekwa ụlọegwu nke ya akpọrọ 'Empire Mates Entertainment' bụ E.M.E.Ọ lụrụ omeeiheonyonyo bụ Adesuwa Etomi n'afọ 2017 O bu ụzọ kwuo na ọ ga-azọ nnọchi anya Eti-Osa Federal Constituency n'ụlọomeiwu nta n'okpuru otu Modern Democratic Party n'afọ 2018 nke Babajide Obanikoro meriri ya na ya. Ugbua ọ na-azọ otu ọkwa ahụ mana ọ bụ n'okpuru otu Peoples Democratic Party (PDP) dịka ọ ritere ikike iji aha ha zọ ya bụ ọkwa n'ọnwa Juun afọ 2022. N'Afrika, John Dumelo nke Ghana zọrọ ọkwa onye ụlọmeiwu mana ọ chịtaghị aja. N'abalị anọ nke ọnwa Ọgụstụ afọ 2019, Dumelo nwetara ikike ịzọ ọkwa omeiwu ga-anọchite anya mpaghara Ayawaso West Wougon n'ụlọomeiwu mba Ghana. Mana na ntuliaka e mere ọ chịaghị aja dịka  Lydia Alhassan jibu ọkwa ahụ meriri ya." https://www.bbc.com/igbo/articles/cd1nqq0pz4jo +entertainment Daddy Showkey: Akụkọ ndụ m si wee bido n'okoro ụzọ Onye oti egwu a ma ama bụ John Odafe Asiemo a na-akpọkwa ‘Daddy Showkey’ akọwaala etu o siri too ma malite iti egwu bụ nke e ji mara. Na mkparịụka ya na BBC Igbo nwere, Showkey sị na ndụ ya gbanwere oge nna ya nwụrụ maka ya na nna ya dị na mma nke ukwuu. Ọ sị mgbe ọbụla nna ya bịara Legọs kwa ụbọchị ụka ọbụla, na ha abụọ ga-eyi uwe ọhụrụ yiri ibe ha ma soro gaa n’ụlọụka. Ọ sị na oge aṅụrị ahụ anọteghi aka wee bịa na njedebe n’ihi ọnwụ nna ya. “Nne m agwaghị m na nna m anwụọla, abịara m hụ na ọ kwụsịrị ị na-abịa dịka o si eme na mbụ. “Iji mee ka m ghara ịmata, nne m gara n’ihu na-akwara m uwe ọhụrụ kwa ụbọchị ụka ọbụla. “Otu ụbọchị a nụrụ ka nne m na-ebe akwa na-akpọ aha nna m, ozugbo ahụ a chọpụtara na ọ nwụọla. Nne m amaghị na ihe ahụ mere m jiri hapụ ụlọ gbaa ọsọ gbaga n’okporo ụgbọoloko dị n’Ijora Legọs.” Showkey sị na ọ bụ nnenne ya chọtara ya ma kpọlata ya n’ụlọ, mana ndị enyi ya sokwa ya lọta. Ọ sị na o bidoro mụtawa ke e si akụ ọkpọ (boxing) mana o nweghi onye enyemaka ga-ebinye aka n’akwụkwọ ka ọ gaa n’ihu. Ọ sị na o mechara soro ndị nka na egwu, wee na-eme ndị mmadụ obi aṅụrị dịka ha na-ekiri ya. Daddy Showkey kọwara ka o si bipụta egwu ya nke mbụ nakwa etu ezinaụlọ ya si kpeere ya ekpere ọganihu ma kwado ya. Site na mgbe o bipụtara ọpụrụiche egwu ya, ma nke a na-agba agba bụ galala, ọtụtụ ndị ọgụụ egwu ọzọ helitere isi ma bido iṅomi ya n'egwu nke ya. Na mkparịụtaụka a, Showkey tinyekwara ọnụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ntoroọbịa, Ipob na ihe ndị ọzọ. Kirie ihe onyoonyo a n'uju. Ndị mere akụkọ a: Olufemi Gabriel, Adline Okere na Vining Ogu https://www.bbc.com/igbo/afirika-60309982 +entertainment """Na mmụọ ka agwara m ga kụwa ufie, ngwa egwu Igbo a na-akụrụ ndị Eze""" "Ufie bụ Ikoro pụruiche a na-akụkarị na Mbaukwu, Anambra steeti. Ihe ngwaegwu a ji pụọ iche bụ na ikoro ndị ọzọ na-adịna ala mana Ufie na-akwụ ọtọ. Mazi Sylvester Ifeanyichukwu Agu bụ onye e ji Eze Ufie n'Igbo niile were mara sị na ọ bụ mmụọ kuziere ya ịkụ ya bụ ngwaegwu. O sị na ya malitere ịkụ ya bụ Ikoro n'afọ 1991. Ọ sị na ""Ufie bụ egwu ndị Eze na ndị Chiri echichi. Ndị nze na ọzọ"". Ọ sị na ya bụ ngwaegwu na-alazị ala maka na ""e rukwaghị mmadụ ise n'akụ ya n'ala Igbo"". Mazị Agu ji Ufie ekwu okwu dị iche iche. Ọ na-atụkwa ya bu ekwe bụ nke o ji Oke osisi ngwu atụ. Ọ sị na Ngwụ bụ oke osisi n'ala Igbo nke pụtara na onye ji ya atụ ya bụ ekwa na-akpachapụ anya ya. Ịkpachapụ anya abụghị naanị maka ịba onye ahụ n'anya maka okpukpo ọ na-ekpo, ka ma na onye ahụ kwesiri ịdowe onwe ya asọ. Ọ sị na nwaanyị anaghị atụ ufie mana o nwereike ịyọ ịchaka e ji a akụ ya bụ egwu. Mazị Agụ na-akụ Ufie n'omenala mana ụka. Gịnị ka 'ufie' bụ? Ufie bụ ngwa e ji akụrụ ndị Eze egwu n'ala Igbo. E si n'osisi ugu akọpụta ya bụ ngwa egwu. Ọ bụ sọọsọ ndị mụtara ya bụ ngwa egwu na-eti ya. Sylvester Ifeanyichukwu na-asị na ọ bụ sọọsọ ndị echiri echichi ka a na-akụrụ ya bụ ngwa egwu a. Kirie ya n'ụjụ. Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Chiemela Mgbeahuru" https://www.bbc.com/igbo/afirika-60637509 +politics Lee ihe ndị ọkachamara kwuru maka ndị gbajọburu Goodluck Jonathan hara Buhari "Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'alaigbo adọọla onye bụbụ Onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Ebele Jonathan ya egekwala ndị na-asị ya pụta ndọrọ ndọrọ onyeisiala Naịjirịa ọzọ ntị. Chima Nnaji bụ onye ọkaiwe sị na ""ọ bụru m bụ Jonathan, agaghị m ege ndị ahụ ntị maka na ha ga-emetọ ya"". O kwukwere na otito niile a na-eto Jonathan nke ikpe azụ a bụ otito ntogbu na-egbu nwankita. Nnaji dọrọ ya aka na ntị sị ya anwakwala anwa pụta ọzọ ""n'ihi na ọnweghịzị ihe ọzọ ọ ga-emeli maka ọtụtụ mmiri agafeela okpuru akwa mmiri"". Larry Oguego na nke ya kwuo na ya bụ otito a na-eto Jonathan bụ ka e nwere rabata ya ịzọ ọkwa ọchịchị Onyeisiala ọzọ. O kwuru na ya nwee ohere na ya ga-asị Jonathan ya apụtakwala maka imebi aha ọma ọmetagooroa onwe ya. Ọ sị na ya bụ oku dịka azụ atụpụụrụ oke ka ọ bịa rie nwụọ. Larry na-akọwa na Jonatha ịza ụdị oku ahụ ga-eme ka ndị Odida anyanwụ tufuo afọ anọ ha maka na Jonathan nwere naanị afọ anọ ịchị Naịjirịa dịka ọ chibugoro afọ anọ na mbụ. O na-ekwusi ike ""na ihe ka mkpa abụghị ka ndị ndọrọndọrọ na-esi ọnwụ na ha ga-achịzụ afọ asatọ ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ."" O kwuru na ọ bụrụ na onye na-achị anaghị achịta, ndị mmadụ nwere ohere ịwepụ ya tinye onye ọzọ sikwa mpaghara ahụ. Larry na-akọwa na nsogbu Naịjirịa ugbua akarịala ihe Jonathan ga-ebuli ma na-arịọkwa ka ọ ghara ikwe ndị mmadụ dughie ya ụzọ. Dele Momodu bụ onye nwe Ovation Magazine ekwuola ọzọ na ya dajọrọ nwere gbasa ozi megide Jonathan n'afọ 2015 nke nyere ohere ka Onyeisiala Muhammadu Buhari were bata n'ọchịchị. Okwu ya na-apụta dịka ozi Goodluck Jonathan wepụtara n'afọ 2011 mgbe ọ nọ n'ọchịchị pụtara na-ewu. Momodu onye kere ya bụ ozi n'akara Instagram yọrọ mgbaghara ọzọ maka ire enwe zụrụ nkịta. Mana ọ bụghị naanị Dele Momodu bụ ndị Naijiria nwere agba katọrọ Jonathan oge ọ na-azọ ọkwa onyeisiala agba nke abụọ bụ ndị na-ata aka n'eze ugbua. Lee ụfọdụ n'ime ha: na ihe ha kwuburu: N'elu ya bụ akụkọ ka otu nwaanyị ama ama na-eme ihe onyonyo ndi Yoruba bụ Bimbola Akinsanya nọ bee akwa arịrị sị ""ọ na-aghịa m ahụ ịgbaghara onwe m maka iso chụpụ Jonathan n'ọchịchị. Ọ na-afụ m ụfụ n'obi"". Nke a mere BBC jiri mawa ime n'ala ịcheta ugboro ole ndị mmadụ kwuhiere ọnụ n'isi Jonathan. Dino Melaye Onye mbụ gbatara n'uche bụ Mazi Dino Melaye bụbu onye omeiwu nọchitere anya Kogi West n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa pụtara n'ihu ọha yọọ Jonathan mgbaghara maka nkọtọ niile ọkọtọrọ ya nakwa ka ha siri gbahapụ ya banye APC. Dino bere akwa arịrị a na-ebe ọ gara emume maka ịkpupe akwụkwọ ọhụru n'Abuja n'afọ 2020 ebe ọ nọ sị ""Mụ bụ Dino Melaye ji ohere a ekwuputa n'ihu maka ọha ọtụtụ ihe megoro nso nso a, a chọrọ ikwu sị na mgbe mbụ a nọ n'ọchịchịrị, ugbu a anya emepeela... Onyeisiala Goodluck Jonatha, a chọrọ m iji aha ndị niiel gbahapụrụ gị na-asị gị ndo... enweghị ọtụtụ mmadụ dị ka gị. A na m arịọ chineke ka ọ nye m ụdịrị obi gị"". Ndị ọzọ okwu ya dara ụda bụ ndị Northern Elders Forum nke Hakeem Baba-Ahmed ndị onyeisi mgbasa ozi ha.Baba-Ahmed sị na ""anyị na-ata onwe anyị ụta maka ịchụpụ Jonathan webata Buhari. Onweghị onye obi dị mma maka ihe Buhari na-eme. Anyị tụrụ anya na ọ ga-eme karịa ihe a ọ na-eme"". Nwaada ama ama n'ọrụ onyonyo ndị Yoruba bụ Ibironke Ojo-Anthony nke a na-etu Ronke Oshodi-Oke gwara arịrị n'ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia n'afọ 2020 ebe ọ na-akwa ngaaramara maka iso chụpụ Goodluck Jonathan. Ronke tara onwe ya ụta nke ukwu maka ịso chụtụọ Jonathan na-ekwukwa na ọ bụ ya so bute ahụhụ niile ndị mmadụ na-ata ugbua ma were ohere ahụ na-arịọ mgbaghara. Onye nnọchite anya Borno South n'ụlọ omeiwu ukwu bụ Ali Ndume sọkwa rịọ Jonathan mgbaghara maka nkatọ na mgbaokpuru o so gbasa gọomentị ya. Ndume kwuru sị na ""ndị Naịjirịa anaghị ama uru ihe ha nwere bara rụọ mgbe o funahụrụ ha"". Ndume chetere ka ndị mmadị mmadụ sị akparị Jonathan na-akpọ ya onyeisi ndị Boko Haram. Ọ sị ""eso m n'otu ndi katọrọ ya nke ukwuu"", dịka ọ jakwara ya ike maka ịgbanwe ihu usoro ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa. Onye ọzọ bụ Timi Frank bụbu osote ọdeakwụkwọ mgbasa ozi ndị APC bụ onye degaara Goodluck Jonathan akwụkwọ mgbaghara na-arịọ ka ọ gbaghara ya maka nsogbu niile ya butere ya mgbe ọ nọ n'ọchịchị." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59582805 +health Mosquito Bites: Lee ihe asaa mere ahụ gị ji adọta anwụnta karịa ndị ọzọ Ọtụtụ oge ka ụfọdụ mmadụ na-ekwu na anwụnta anaghị ekwe ka ha tinye ụra n'anya. Mana ndị ọzọ nọkwa n'otu ebe ahụ anaghị aghọta ihe ha na-akọ n'ihi na anwụnta anaghị ata ha. Nke a bụ maka na ndị ahụ ha na-adọta anwụnta karịa ndị ọzọ. Ihe na-akpata anwụnta ji agakwu ụfọdụ ma na-agbara ụfọdụ ọsọ dị icheiche. Nnyocha Sayensị gosiri n'ezie na ọ bụghị mmadụ niile ka ahụ ha na-amasị anwụnta. 1) Agwa (Colour) Nnyocha egosila na anwụnta na-achọkarị ebe gbara ọchịchịrị karịa ebe nwere nnukwu ihe. Nke a pụtara na anwụnta ga-aka agakwu onye yi uwe ojii maọbụ uwe na-anaghị amuke amuke. Ọ bụrụ na i yi akwa ojii, o nwere ike bụrụ ihe na-adọtara gị anwụnta. 2) Ọsịsọ (Sweat) Ọ bụrụ na i nwere ahụ na-agba oke ọsịsọ, mara na gị na-anwụnta ga-abụ nnu na mmanụ. Nke a bụ maka na nnyocha gosiri na ebe na-ekpo ọkụ ma nwee mmiri, na-amasị anwụnta nke ukwuu. Chetakwa na ọsịsọ nwere isi ọ na-ewepụta n'ahụ mmadụ nke nwekwara ike ịdọta anwụnta. 3) Mmanya na-aba n'anya (Alcohol) Na 2020, ndị ọkachamara mere obere nnyocha nke gosiri na anwụnta na-aka agakwu ndị ṅụrụ mmanya na-aba n'anya, ọ kachasị nke bekee na-akpọ 'beer'. O dochaghị anya ihe kpatara nke a, mana a na-eche na o nwere ike ịbụ maka isi ya. 4) Ụdị ọbara Nnyocha gosiri na ndị nwere ụdị ọbara O na-aka amasị anwụnta karịa ndị nwere ụdị ọbara A maọbụ B. Iji mee nnyocha a, e tinyere mmadụ ole ma ole n'ime otu ọnụ ụlọ, mana anwụnta tara ndị nwere ụdị ọbara O pasentị 83, ebe ọ tara ndị nke ọzọ pasentị 46.5. Mana a ka na-eme nnyocha iji mata ihe kpatara nke a. 5) Onye dị ime Dịka ụfọdụ nnyocha siri gosi, ahụ ụmụnwaanyị dị ime na-aka amasị anwụnta karịa ndị na-adịghị ime. Nke a nwereike ịbụ maka maka na ahụ nwaanyị dị ime na-ekpotụ ọkụ karịa onye nke adịghị ime. Ụmụnwaanyị dị ime na-akakwa ekuputa ikuku 'carbon dioxide' karịa. Ụdị ikuku a na-amasị anwụnta nke ukwuu. 6) Mgba isi ọma (perfume) Cheta na enwere okooko (flower) na-amasị ụmụanwụnta ifega. Chetakwa na ọtụtụ mgba isi ọma bụ okoko ndị nwere isi ọma ka e ji emepụta ha. Ọ bụrụ na ụdị mgba isi ọma nke ị gbara na-ahụ gị b�� ụdị nke e ji okoko na-amasị anwụnta mepụta, mara na gị na anwụnta ga-abụ enyi n'ụbọchị ahụ. 7) Ahụ isi Ihe na-akpata ahụ mmadụ ji esi isi, maọbụ 'body odour' na bekee, bụ ihe anaghị ahụ anya nke bekee na-akpọ 'micro organisms'. Ihe ọzọkwa bụ mburupụtaụwa bekee kpọrọ 'genetics'. Ọ bụrụ na mmadụ nwere ahụ isi, anwụnta nwere ike ị na-abịakwute ya karịa. Nke a bụ maka na anwụnta na ụmụ 'micro organisms' ụfọdụ na-akpata ahụ isi na-adị na mma. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58531552 +religion Nigerian churches: Gịnị kpatara ndị Igbo ji agakarị ụlọụka ndị a? "Ọ bụ maka na ọ bụ ndị Igbo hibere ụka ndị a ka e nwere ihe ọzọ kpatara ha ji agakarị ha? Tupu ndị ọcha eweta ụka n'ala Igbo, ọtụtụ ndị mmadụ na-efe arụsị maọbụ ikpere 'Chi' ọmenaala nke ụfọdụ na-akpọ ""ịgọ mmụọ"". Mgbe gboo, oge ụka ka batachara ala Igbo, ndị ụka na-agbakọta n'otu ebe, ebe ha na-anọ aka ụka, pụtara na onye ọbụla na-ama ibe ya, mana ugbua, ọ rara ahụ ịhụ ụdịrị ụka ebe ndị mmadụ ga-ama onye bụ onye, maka na ụlọụka bidoro na-amụbanye nakwa na-ekesa onwe ha gburugburu. Ọtụtụ ndị Igbo ugbua bidoro mepee ụlọụka nke ha, ma nwee igwemmadụ na-abịa aka ụka ebe ahụ, mana ihe a na-ekwu maka ya ugbua bụ ihe ụlọụka ndị Igbo na-aka aga na Naịjirịa. Ọ bụghị ihe e zoro ezo na ndị Igbo anaghị eji ofufe egwu egwu, nke a malitere n'oge ha na-ekpere 'Chi' omenaala, nke bụ na ọtụtụ ndị mmadụ nwere 'Ikenga' nke ha n'ime ezinaụlọ ha. Ịga ụka mere ka ha na-achọkwa ihu Chineke etu ha si mara. 1. The Lord's Chosen Charismatic Renewal Ministry: Lazarus Muoka bụ onye hibere ụlọụka a n'ọnwa Disemba 2002. Ọtụtụ mmadụ ọkachasị ndị Igbo, na-aga ya, ma na-eme ihe ndị dị na ya (dịka ị bata Legọs n'igwe ma o nwee emume). Ihe e ji mara ha bụ akwa na-enwuke enwuke, nke ha ji 'egbochi ihe ọjọọ'. Ụfọdụ nwere ike ịkpọ ha ụka ọgbara ọhụrụ. Ha na-akpọ onwe ha 'Chosen army' maọbụ 'Chosen mopol' nke pụara ndị agha a họpụtara ahọpụta n'Igbo. 2. Christian Pentecostal Mission, CPM: Obiora Ezekiel bụ onye hibere ụlọụka a n'afọ 1978. Nke a bụkwa ụlọụka ọzọ ndị Igbo na-agata ọnụ ha. E ji 'Demon Bulldozer' maọbụ 'the Lord's General' mara ya. 3. Catholic: E hibere ụlọụka katọlik nke mbụ na Naịjirịa bido n'oge 1840 gbadatawa, na Kaduna, Legọs nakwa Ọnịcha. Ị jụọ ndị mmadụ, ọtụtụ ga-agwa gị na ọ bụ ndị Igbo kacha ekpe Katọlik na Naịjirịa. E ji ""ndị ụka fada"" nakwa ikpe 'rosary' maọbụ 'chaplet' nakwa iyi 'scapụla' mara ha. Popu bụ onye na-achịkọta ha na gburugburu ụwa niile, ndị ụkọchukwu ha anaghị alụ nwaanyị. Ị ma na ụlọakwụkwọ katọlik ebe a na-azụ ndị ga-echi fada (seminary) kacha n'ụwa niile dị n'Enugwu? A na-akpọ ya 'Bigard Memorial'. 4. Anglican: E hibere ụlọụka Anglikan nke ọtụtụ na-akpọ 'CMS' na Badagry dị na Naịjirịa n'afọ 1842. Ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị ndị Igbo na-aga ụlọụka a. Ọtụtụ n'ime ha emechaala bụrụ ụkọchụkwu, ma ka na-abụ ya ruo echi. Otu ebe o si dịrị iche na nke ụka katọlik bụ na ndị ụkọchukwu ha na-alụ nwaanyị ma mụọ ụmụ ma ha chọọ. 5. The Redeemed Evangelical Mission (TREM): E hibere ụlọụka a n'ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị, 1981. Onye nwe ya bụ Mike Okonkwo. Ọ gara ọtụtụ ụlọakwụkwọ na-akuzi maka ofufe, ma na Naịjirịa na mba ofesi. Ọtụtụ ndị Igbo na-agakwa ụka a. 6. Watchman Catholic Charismatic Renewal Movement Aloysius Chukwuemeka Ohanebo hibere ụlọụka a n'afọ 2000. E ji izisa ozi maka ""ọgwụgwụ oge"" mara ya. 7. Ụlọụka ndị ọzọ Ụlọụka ndị ọzọ ndị Igbo na-agakarị bụ Assemblies of God, Grace of God Mission, Living Christ Mission, Presbyterian, Methodist, nakwa ndị nke a na-akpọ nke ""ọgbara ọhụrụ"" dịka Redeemed Christian Church of God, Living Faith Church nke e ji 'Winners Chapel mara, wdgz. BBC Igbo jụrụ ndị na-agụ ya ihe kpatara ndị Igbo ji aga ụlọụka ndị a, lee ihe ha kwuru ebe a:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-44963077 +sports Olympic Games Tokyo 2020: Ka o si aga n'egwuregwu Olympics 2020 A malitela emume mmepe asọmpi Olympics 2020 nke na-eme na Tokyo dị na mba Japan taa bụ Fraide abalị 23 nke ọnwa Julai afọ 2021. Ọtụtụ mba ruru iri ise na otu bịara ya bụ asọmpi ji ọkọlọtọ ha dị iche iche na-efe dịka ha na-egosi ụwa onwe ha. Mba ndị dịka Greece bụ ndị bu ụzọ gosi onwe ha site n'ife ọkọlọtọ ha ebe mba Japan bụ ndị na-ahazi ga-abụ ndị ikpeazụ. Mba Jamini nọkwa n'egwu Mba Itali pụtakwara n'egwu igosi ụwa ihe ha jiri biri. Mba Briten gosikwara na ha abụghị ndị ikpeazụ n'okwu banyere asọmpi Olympic Ihe I kwesịrị ịma maka egwuregwu Olympics Tokyo 2020 Kamgbe a malitere egwuregwu a kpọrọ Olimpik n'afọ 1896 na mba Greece, onwebeghị nke dịka nke Tokyo 2020. Otu okpụrụkpụ ihe kpatara nke a bụ n'ihi ọrịa ọjọọ coronavirus maọbụ covid19. Taa bụ Fraịde, abalị 23 nke ọnwa Julaị 2021, ka asọmpi nke afọ a na-amalite n'uju. Ndị Afrịka a bụ ndị ejiri nọchite anya mpaghara dị iche iche n'Afrịka. A họpụtara ha dịka etu asọmpị Olympik sirimetụta ha ya na ntụruugo ole ha nwetarala ma etu egwuregwu ha na-eme siri pụo iche. Ndị Naịjirịa ga-eso n'asọmpi Olimpik 2020 Naịjirịa mmadụ iri isii (60) ga-anọchi anya Naịjirịa n'asọmpi 'Olympics' nke afọ a. Asọmpi ha ga-esonye na ya gụnyere: 'Basketball' (ụmụnwoke na ụmụnwaanyị, 'Artistic Gymnastic', na 'Athletics' (Ọsọ, ịwụli elu, ịtụ ihe ọtụtụ). Ndị ọzọ bụ: 'badminton', mgba, mgba takwando, ịkpa ụgbọ, ọsọ ụgbọ mmiri (canoe sprint), igwu mmiri, na tebulu tennis. Onye bụ onye ndu (captain) otu Naịjirịa n'Olimpik afọ a bụ Aruna Quadri na-apịa tebulu tenis. Nke a bụ 'Olimpik' nke atọ Aruna Quadri na-agara Naịjirịa Ndị otu basketball Naịjirịa enwetaghị akwa ha ga-eyi n'asọmpi a n'oge, dịka ndị 'custom' jichiri ya ogologo oge dịka e si mba Chaịna tụlata ya. Ọ bụ ndị a na-akụ basketball ji aka ha zụtara onwe ha akwa dịka ha na-eme nkwado ha. A na-akwụ mmadụ ụgwọ maka i turu ugo n'asọmpi Olimpik? E nweghị ego ndị na-ahazi egwuregwu Olimpik na-akwụ onye ritere ọla ọcha, ọla edo maọbụ ọla nchara. Mana mba dị icheiche mapụtara ego ha na-akwụ, maọbụ ihe ndị ọzọ ha na-emere ndị tuteere ha ugo na ya bụ asọmpi. Iji maa atụ, mba Amerịka na-akwụ $37,500 maka ọla edo, $22,500 maka ọla ọcha, na $15,000 maka ọla nchara. Mba dịka Singapore na-akwụ ndị be ha otu nde dọla maka ọla ọcha, ebe mba Indonesia na-enye ndị nke ha $750,000 maka ọla edo. Odochabeghị anya ego ole gọọmentị Naịjirịa ga-eji tie onye ritere ọla ọbụla n'Olimpik nke afọ a aka n'obi. Mana n'egwuregwu nke mba Afrịka (African Games) e mere na Morocco na 2019, gọọmentị Naịjirịa nyere ndị tuuru ugo $3000, $2000 na $1000 maka ọla edo, ọla ọcha na ọla nchara n'otu n'otu Otu onye kwesịrị ka a kwanyere ya ugwu n'ụzọ pụrụ iche n'Olimpik nke afọ a bụ Mike Brown. Otu 'basketball' Naịjirịa na-emezi nnọọ nke ọma ugbua n'ihi nwa amadi a bụ onye nkuzi ha. Mike Brown anaghị eri ụgwọ ọnwa ọbụla dịka ọ na-akuziri ndị Naịjirịa ugbua, kama o kwuru ka e were ụgwọ ọnwa ya na-akwalite egwuregwu 'basketball' na Naịjirịa. Ọ bụkwa ya mere ọtụtụ ụmụ Naịjirịa a mụrụ na mba ofesi jiri kweta ịkụrụ Naịjirịa bọọlụ. Ihe i kwesịrị ịma maka Mike Brown Usoro Ndị Afrịka a bụ ndị ejiri nọchite anya mpaghara dị iche iche n'Afrịka. Ahọpụtara ha dịka etu asọmpị Olympik sirimetụta ha ya na ntụruugo ole ha nwetarala ma etu egwuregwu ha na-eme siri pụo iche. NDI MERE YA: Editorial production by Nkechi Ogbonna, Princess Abumere and Muthoni Muchiri. Design by Olaniyi Adebimpe and Millicent Wachira. Web Developer: Purity Birir. Additional support by: Sally Morales and Celestine Karoney. FOTO: Getty Images, The International Basketball Federation, AFP, Nigerian News, Nigerian Rowing Canoeing and Sailing Federation, Nigerianews, Mekseb Debesay, Sailing Club of Mozambique, Giana Farouk, EPA, Press Focus/News Pix via PA, Erwythereyet via Twitter, Bruce Viaene via Olympics, ClimbZA, DW via Club of Mozambique. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-57918024 +business Nigerians in Ghana: Anyị aṅụbeghi miri tọgbọ iko - Onyeisi ndị Nigeria na-azụ ahịa "Dịka Kizito Ikechukwu Obiora bụ onyeisi ""Nigerian Union of Traders Association"" - bụ otu ndị Naịjiriịa na-azụ ahịa na mba Gana - siri kọwaara BBC Igbo ihe na-ebe ka na-ebekwa na mpaghara Ashanti na mba ahụ. Site na Fraịde bụ abalị iri na anọ nke ọnwa Junn ruo ụbọchị Tusde nke izu a bụ izu atọ nke ọnwa Juun, ndị amaghị ndị ha bụ awakpochara ndị Naịjirịa ma manye ha ka ha gbachie ụlọ ahịa ha. Maazị Obiora sị na agbanyeghị na ndị uweojii sị ha gbapee, ọtụtụ ndị mmadụ ka nọ na nkwụcha maka ha amaghị ihe ndị na-achụ ha bu n'obi. Dịka Maazị Obiora siri kwuo, nsogbu a malitere oge ụmụokoroọbịa malitere ngagharị iwe na-asị ndị Naịjirịa kwara laa. ""Ndị a na-aghagharị na-aba n'ụlọ ahịa ndị mmadụ asị ha mechie maka na ha achọghị ndị Naịjirịa. Ha sị na anyị bụ ndị ntọrị."" Obiora sị na etiri ndị mmadụ ihe ma merụọ ụfọdụ ndị ọzọ ahụ. Ihe onyonyo pụtara na soshal midia Gana gosiri ndị na-eme ọgbaghara a na-agụ egwu asị na ha achọghị ndị Naịjirịa na be ha. Obiora sị na ọbụghị ihe taata, na ọtụtụ mmadụ achọghị ọnụnọ ha nọ na Gana. N'afọ 2018, ndị Naịjirịa nọ na Gana tikwara mkpụ maka mwakpo na ịchụpụ. Ọnụ na-ekwuru uweojii na Ashanti bụ Godwin Ahianyo gwara BBC Igbo na uche ha dị n'ihe mere na ebe niile nọkwa juu ugbua. Ọ gakwara n'ihu sị na ha na-eso nzụmụkwụ mmadụ abụọ ha sị aka ha dị na mkpa mkpa a. Ọ sị: ""Anyị na-enyo ihe nkiri pụtara n'ihe mere iji nwụchie ndị kpara ike a."" Ọ gakwara n'ihu kwuo na-agbanyeghi na onweghi onye aka ji ugbua, ha na-achọ mmadụ abụọ ha sị n'aka ha dị na ọgbaghara. Naịjirịa chụru ndị Gana bi na Naịjirịa n'afọ 1983, nke mere ọtụtụmmadụ na-eche na onwereike bụrụ mmekwụta ka ndị Gana na-eme ugbua. N'izu a kwa, otu onye Naịjirịa bụ ọkammụta na mahadụm dị na Gana banyekwara nsogbu maka itinye ọnụ n'ọnụ ndị Naịjirịa na mba ahụ, ọkachasị ebe o si metụta ebubo na mkpasi agwa oke agbụrụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-48722269 +politics Soludo Vs Willie Obiano: 'Anambra steeti ji ụgwọ ruru N100bn' "Gọvanọ Chukwuma Soludo bụ onye na-achị Anambra steeti ugbua kwupụtara okwu ịtụ n'anya banyere etu ọnọdụ ego mkpata na ntufu steeti ahụ siri dị n'aka Willie Obiano bụ onye ka chịpụrụ Anambra steeti. Na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Arise TV nwere taa bụ Tuzde ọ sị: 'Ego m natara mgbe enyefere m ọchịchị nke dị n'akpa Anambra steeti ruru nde Naịra puku narị abụọ ebe ụgwọ Anambra steeti ji karịrị ijeri narịa otu narị' O kwuru na ọnọdụ ego steeti ahụ daturu ada atu. Lee ọkpụrụkpụ ihe ole ma ole ndị ọzọ o kwuru na mkparịtaụka ahụ banyere ọnọdụ ego steeti ahụ: N'ihe awa ole na ole e duru gọvanọ Charles Soludo nke Anambra Steetị n'iyi ọrụ, ọ kpọpụtala mmadụ atọ n'ime ndị ga-eso ya rụọ ọrụ. Nke a dị n'ozi e wepụtara n'aka Facebook Soludo TV na mgbede Tọzde 17 Maachi, 2022. Ndị a gụnyere; Solo Osita Chukwulobelu - Odeakwụkwọ gọọmentị Anambra Steetị, ọ jikwa ọkwa ahụ mgbe gọvanọ Willie Obianọ nọ n'ọchịchị Chukwudi Okoli - Onyeisi ngụkọ ego Anambra Steetị Gịnị bụ ọrụ Onyengụkọ ego Gọọmentị? Chinedu Nwoye - Osote onyeisi ndị ọrụ gọvanọ Gịnị bụ ọrụ Osote onyeisi ndị ọrụ gọvanọ na-eme? Ernest Ezeajughi - Onye nchịkọta ndị ọrụ oyibo a kpọrọ ""Chief of Staff"" na Bekee Gịnị bụ ọrụ onye nchịkọta ndị ọrụ oyibo na steeti? Mgbe Soludo na-ekwu okwu mbụ ya dịka gọvanọ, o kwere nkwa ịkpọpụta ndị ga-arụ ọrụ dịka kọmishọna n'ime otu izuụka. Akụkọ ka na-abịa..." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60787807 +business Igwebuike... Etu mmepe si bata na mpaghara ọwụwa anyanwụ "Ndị Igbo na-atụ ilu sị: ""bunu bunu, ibu anyị danda."" Nke a pụtara na a gbakọọ aka nyụọ mamịrị ọ gbaa ụfụfụ. Akụkọ a bụ etu ndị Igbo si jiri aka ha weta mmepe n'obodo ha dị icheiche, na-echeghị enyemaka gọọmentị. Ka a lụchara agha Biafra n'afọ 1970, ala Igbo niile tọgbọ chakoo n'ihi na ogbunigwe lara ọtụtụ akụnaụba Igbo ji eme ọnụ n'iyi. Mana o teghị aka, ndị Igbo gbakọrọ ọnụ malitekwa iwuli obodo ha dị icheiche, na-enweghị nnukwu enyemaka ọbụla site n'aka gọọmentị. N'agbanyeghị na Onyeisiala nke chịrị ka agha Biafra biri bụ Jeneral Gowon kwuru na aga-eji 3R arụgharị ebe ogbunigwe dara, tụmadị n'ala Igbo ka Naịjirịa wee buru otu. Mana ndị Igbo echeghi aka n'atụmatụ gọmenti sọọsọ. Ha bidoro gbawa mbọ, wulitewakwa obodo ha site n'enyemaka si na nzụkọ ha na mba dị icheiche ha bigasị. Otu n'ime ụzọ ha si mee nke a bụ site n'otu obodo dị icheiche nke a kpọrọ 'Town Union' na Bekee. 'Town Union' bụ ụdị otu jikọrọ ndị niile si n'otu obodo ebe ọbụla ha hụrụ onwe ha. Ọ bụ otu ndị a na-agbakọta tụkọta ego, tụkọta alo, gbakọta aka ma na-egbo mkpa dịịrị obodo ha, na-echeghị ka gọọmentị bịa nyere ha aka. Dịka ndị Igbo bụ ndị njem, ha na-agbakọ n'obodo ọbụla ha hụrụ onwe ha iji mata onwe ha ma tụkọrịta alo. Benjamin Obidegwu bụ onye ọkaiwu rụrụ ọrụ dịka onyeisi 'town union' nke obodo ya bụ Obodoukwu, n'Imo steeti kwuru na ọgbakọ nke ndị obodo ya malitere n'afọ 1945. Obidegwu kọwara na ọ bụ oge a lụchara agha ka ọtụtụ gbalọtara wee hụ na enweghị ezi mmepe ọbụla n'obodo. Nke a mere ka otu obodo ndị a malite itule ihe ha ga-eme iji mepee obodo ha ebe ọ dịka gọọmentị agbakụtala ha azụ. Ọ gara n'ihu kọwaa ọtụtụ ihe mmepe dịka ụlọọgwụ, ụlọọrụ ndị uweojii, ama egwuregwu, ụlọakwụkwọ, nakwa ụlọ ọba akwụkwọ, bụ nke ọchịchị ya rụrụ maọbụ rụgharịa oge ọ bụ onye isi ha. Ngwa ka anyị gosi ebe ụfọdụ aka izu kpara nkata ọganihu n'ala Igbo: Aka chịburu Imo steeti dịka gọvanọ site 1979 ruo 1983 bụ Sam Mbakwe ketara ala ebe a ga-arụ ọdọụgbọelu n'Imo steeti. Ndị Igbo niile pụtara n'Igwe ma kwadọọ ọrụ ahụ, nke mere na a rụchapụrụ ya bụ ọdọụgbọelu ahụ n'ihi mbọ niile Sam Mbakwe gbara, ha wee gụọ ya bụ ọdọugbọelu aha gọvanọ. N'obodo dị icheiche otu 'Town Union' na-arụ ụlọakwụkwọ, ụlọ ọgwụ, ụlọọahịa, ụlọorụ ndị uweojii, okporoụzọ, na ihe ndị ọzọ. O nweghi obodo mmadụ ga-aga n'ala Igbo ebe agaghị ahụ ọkpụrụkpụ ihe ndị 'town union' obodo ahụ rụpụtara. N'Abia steeti, Abiriba bụ otu obodo a ma ama ndị obodo ji aka ha wulie ala ha. Ogbakọ obodo ha bụ 'Abiriba Communal Improvement Union (A.C.I.U.)' nyere aka nke ukwuu na mmepe obodo ha. Otu ọgbọ dị icheiche n'Abịrịba sokwa nye aka n'ọrụ mmepe. Lee etu otu onye si kọwaa ya n'ọbaozi Twitter: N'Ebonyi steeti, ọ bụ ndị obodo ji aka ha wulite ọrụ ugbo nkọpụta osikapa tupu gọọmentị etinyere ha aka. Ndị obodo na-agbakọta tụkọọ ego wee na-arụ ọrụ osikapa ha ma were ego ha rụtara na-enyere onwe ha aka. Ugbua, ma gọọmentị etiti ma nke steeti na-achụ ndị ọrụ ugbo n'Ebonyi n'ihi mkpa na-egbo n'obodo Naịjirịa. Ịzụ ndị mmadụ n'akwụkwọ O nwee otu nwata ụbụrụ ya na-aghọ nkọ n'obodo, mana nne na nna ya enweghị ego iji zụọ ya n'akwụkwọ, ndị otu obodo ga-agbakọta aka na-akwụrụ nwata dị otu a ụgwọ akwụkọ. Oge ụfọdụ, ha na-ezipu nwata ahụ ala bekee ka ọ ga gbajie mkpịsị be ndị ọcha. Ọ bụzị ọrụ dịịrị onye ahụ ịgba mbọ hụ na ọ zụrụ ndị ọzọ n'akwụkwọ ma nyekwara ha aka inweta ọrụ ka obodo wee na-eto. Ịzụ ndị mmadụ n'ọrụaka maọbụ ahịa N'agbanyeghi na nke a zuru ala Igbo dum, otu obodo pụtara ihe kacha eme nke a bụ Nnewi, dị n'Anambra steeti. Ndị obodo na-akpọrọ ụmụaka obodo ha anya ruru ala, kpọnye ndị obodo ha ndị ọzọ na-eme ọfụma n'ahịa maọbụ ọrụaka. Nwata ahụ ga-anọ ọtụtụ afọ ma mụtachaa ya bụ ahịa maọbụ ọrụ, tupu nna ya ukwu enye ya ego iji malite nke ya. N'ụzọ dị otu a ka ndị ọgaranya si baa ụba n'obodo Nnewi nakwa mpaghara ala Igbo dị icheiche. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-54054076 +health Coronavirus Tips: Mgbanaka 'gloves' ọ ga-egbochi gi ibute coronavirus? Ndị mgbanaka (hand gloves) dị mkpa bụ ndị ọrụ ahụike na ndị na-arụ ebe a na-agwọ ndị nwere ọrịa coronavirus. Ọ bụghị mmadụ niile ka ọ dị mkpa na ha ga-eji 'gloves' yichie aka. Mana ọ bụrụ na ị yiri mgbanaka, lekwa etu ị ga-esi akpachapụ anya. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Chimezie Ucheagbo https://www.bbc.com/igbo/52458109 +sports Leicester City: Brendan Rogers na Kolo Toure anarala ọchịchị Leicester City enyela Brendan Rogers ọrụ onye nchịkọta otu ha na-erughi ụbọchị atọ ha chụrụ Claude Puel. Ka ha na-ewe Rogers chịkọtaburu otu egwuregwu Liverpool site n'afọ 2012 ruo 2015 n'ọrụ, ha kpọbatakwara Kolo Toure gbaburu bọọlụ ọtụtụ afọ n'Arsenal, Liverpool na Manchester City. Ọ kpọbatakwara Chris Davies nakwa Glen Driscoll ga na-elekọta ahụike ndị otu a. Cheta na Rogers na Toure rụkọrọ ọrụ n'otu egwuregwu Celtic, ebe Rogers buliri iko asaa n'ime otu afọ na ụma. N'akwụkwọ ọrụ Rogers dị afọ iri anọ na isii binyere aka, ọ ga-anọ na Leicester City ruo ọnwa Juun afọ 2022. Mmeri Buhari Ọ bụrụ na ị nụbeghị, ka anyị gbaara gị ama na Onyeisiala Muhammadu Buhari alọghachịla ịchị Naịjirịa afọ anọ ọzọ. N'okwu o kwuru iji nabata mmeri ya, o kwere nkwa ịgbalị karịa mbụ n'ihe gbasara nchekwa, akụnaụba nakwa ibuso mpụ agha. N'ịkpọpụta onye meriri, onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru na Buhari nwetere vootu karịa nke onye zọrọ ọchịchị n'okpuru pati PDP bụ Atiku Abubakar, ma mezuo ihe iwu kwuru, nke mere o ji pụta ka onyeisiala. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Presidential election 2019: Buhari achakeela ọzọ PDP Ajụla mmeri Buhari Otu pati PDP ajụla ịnabata mpụtara kpọpụtara aha Buhari dịka onye meriri ntuliaka, ka ha na-ekwu na akaebe si n'ọgbọ ntuliaka dị iche iche gosiri na ọ bụ Atiku Abubakar ka ndị Naịjirịa họpụtara. Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ nọ n'ọnọdụ ndị n'ọchị ndị n'akwa maka ndị ha kwadoro na ya bụ ntuliaka. N'ofesi, Ihe ruru mmadụ iri isii ka tọrọ n'ime ebe a na-ezo ezo egwuputa ọlaedo n'ime ala, n'obodo Sulawesi dị na mba Indoneshia. Ndị ọrụ gbatagbata mba ahụ sị na otu onye anwụọla ebe a gụpụtarala mmadụ iri na atọ. N'egwuregwu, Goolu abụọ Angel Di Maria nyere na otu nke Meunier gbakpuru, nyere PSG mmeri na be ha ka ha zutere Dijon n'asọmpi Coupe De France. Gere akụkọ BBC n'otu nkeji Ihe nkiri https://www.bbc.com/igbo/afirika-47384000 +sports Chioma Ajunwa Olympics: E nye m ohere ịzụ ndị Naịjirịa maka Olympics, ihere agaraghị eme ha Chioma Ajunwa bụ nwafọ Naịjirịa mbụ ritere ọlaedo n'ịgba ọsọ Olympiks etinyela ọnụ n'ihe ndị na-agbara Naịjirịa ọsọ na-agabiga ugbua. Ọ sị na ihe butere mmechu ihu a ọkachasị n'egwuregwu Tokyo Olympiks nke 2020 na-eme ugbua na mba Japan bụ maka e nweghi ezi ndị nchịkọta. Ajunwa gaara n'ihu kọwaa ihe e nwere ike ime ka e weghachite Naịjirịa n'ogogo mbụ n'egwuregwu. Kirie ihe o kwuru n'uju. Ndị mere akụkọ a bụ Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo https://www.bbc.com/igbo/afirika-58079592 +sports Israel Adesanya vs Yoel Romero: Odogwu nwaafọ Naịjirịa e turula ugo "Israel Adesanya eturula ugo na asọmpi UFC n'ụtụtụ Sọnde oge o zutere Yoel Romero. Odogwu abụo a zutere n'ogige T-Mobile Arena dị na Las Vegas na mba Amerịka. Romero mara Adesanya aka ịnapụ ya mgbanukwu ""Middle Weight Tittle"" ya. Nke a bụ mbụ mmadụ na-azọsa Adesanya mgbande ukwu a o ritere n'afọ 2019. Adesanya yi uwe ndị Naịjirịa bata ogige egwuregwu ebe a ga-apịa ya bụ ọkpọ. Nwa afọ Naịjirịa a alụọla ọgụ ugboro 18 ma merichaa ha niile. N'aka nke ọzọ, Romero alụọla ọgụ ugboro 13, merie iri, e merie ya na atọ. Adesanya, onye e ji 'the lsat stylebender mara' bụ na Legọs ka a mụrụ ya tupu nne na nna ya agaa mba Ghana, mechaa gaa mba New Zealand. Ọ bụghị naanị ya bụ nwa afọ Naịjirịa na-akụ ọkpọ na UFC, onye nke ọzọ bụ Kamaru Usman, onye e ji 'the Nigerian nightmare' mara. Adesanya na Usman bụcha ọkaibe n'ogogo dị icheiche ha abụọ nọ n'ime ya. Ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya na Adesanya ga-eturu ugo na ọgụ nke taa. @DavicSamuel kwuru na ya kwunyere Adesanya. @SunkanmiShams kwukwara na ya na-ele anya ka Adesanya merie. Onyeisi otu ahụike mba ụwa bụ Tedros Ghebreyesus etoola gọọmentị Naịjirịa maka mbọ ha na-agba iji buso ọrịa coronavirus agha. O kwuru na ọ magburu onwe ya etu ndịọrụ ahụike Naịjirịa si ekekọrịta ihe ha mụtara site n'aka onye mbụ bu ọrịa coronavirus bata n'obodo ahụ. Mana onyeisi nglaba mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Chikwe Ihekweazu kwuru na gọọmentị na-agbasị mbọ ike ịhụ na ọrịa ọjọọ a agbasaghị na Naịjirịa. Ndị isi ndịagha Naịjirịa kwuru na ha ehibela ngalaba ga na-enyere ndịagha aka ileta ahụike ha anya, ọkachasị n'ihe gbasara ọrịa isi mgbaka. Nke a na-abịa dịka ọtụtụ akụkọ pụtara gbasara ndịagha igbu onwe ha maọbụ iji egbe gbagbuo ndị nọ ha okirikiri. N'ụbọchị 26 nke ọnwa February, otu onye agha ji ọkwa 'Corporal' ji egbe gbagbuo ndị otu ya mmadụ anọ, mechaa gbagbuo onwe ya. Nke a mere n'obodo Malam ftori dị na Borno Steeti. N'abalị abụọ nke ọnwa Janụwarị, akụkọ kọkwara etu otu onyeagha si were mma sụkasịa nwunye ya na nwa ya nwoke na be ha n'Ede, Osun steeti. Onyeagha ahụ jikwa mma magbuo onye agbatobi ha, gbukwaa onyeagha ọzọ chọrọ ịnapụ ya mma ahụ. Akụkọ ọjọ ndị a mere ka e hibe ngalaba ga na-eleru ndị agha anya gbasara isi mgbaka. Onyeisi mgbasa ozi ndị aha bụ Onyema Nwachukwu kwuru na ha ehibela 'Psychological Counselling Unit' n'obodo dị icheiche maka ya bụ ihe. Ihe ruru mmadụ iri asaa tọrọ n'ime ụlọ ebe e dopuru ndị a na-enyo enyo maka ọrịa coronavirus iche na mba Chaịna n'abalị Satọdee. A zọpụtara mmadụ iri anọ n'asaa n'ime ha, ebe ndịọrụ gbatagbata ka na-agbalị ịzọpụta ndị ọzọ. Ndị ọrụ mechara kwuo na ha ahụla ozu mmadụ isii n'ime ụlọ ahụ, ebe ihe ruru mmadụ iri 28 ka ha ka na-achọ achọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51788455 +health Ihe atọ mere ụfọdụ ụmụnwaanyị anaghị ekwe eyi ọbante "Ị jụọ ụfọdụ ụmụnwaanyị ma n'ụlọ ma n'ama, ha ga-agwa gị na iyi ọbante (pant) anaghị amasị ha. Ụfọdụ bụ ndị na-eyi ọbante ma a gụrụ gụrụ, ebe ndị ọzọ anaghị achọdị iji ntị anụ ihe gbasara iyi ọbante; iyi ọbante bụ etu o si masị onye. Mana e nwere ihe ọjọọ dị n'iyi maọbụ eyighi ọbante? Ndị ọrụ ahụike ekwuola na ọ bụchaghị ihe ọjọọ, mana o nwere uru na ọghọm. Ụfọdụ uru dị n'eyighi ọbante gụnyere na ikuku ga na-aba gị n'ahụ nke na-enyere aka igbochi ụfọdụ nje dị aṅaa nwaanyị nwereike isi n'agada ya bute. Uru ọzọ bụ na ọ ga-enye aka ibelata isi nke ọsụsụ na-agba ebe ahụ nwere ike ibute; eyighi ọbante ga-eme ka ọsịsọ ahụ kọọ ma ghara ịtọ gị n'ahụ. Na nso nso a ka otu ome ejije Nollywood a ma ama bụ Nkechi Blessing Sunday wuru ewu n'ihi na o kwuru na ọ naghị eyi ọbante. O kwuru nke a iji saa onye ọ yịburu kwuru na ya na ya tisara n'ihi na Nkechi anaghị asa ọbante ya mmiri ọtụtụ ụbọchị. Mana Nkechi sara ya sị na ọ na-ekwu na ọ naghị asa ọbante mmiri ebe ọ bụ na ọ kwụsịrị iyi ọbante oge o ruru afọ 18. Nke a kpalitere okwu ihe mere ụfọdụ ụmụnwaanyị ji agbara iyi ọbante ọsọ. Lee ụfọdụ ihe ndị ahụ ebe a: 1) 'Achọghị m ka o gosi n'uwe m yi': Nke a bụ ihe ụfọdụ ụmụnwaanyị ji ghara iyi ọbante, dịka ọ na-eme ha ihere ịchọpụta na ọbante ha yi n'ime na-egosi n'ime uwe ha yi. Ọkachasị mgbe uwe ahụ na-eke eke maọbụ mgbe uwe ha yi na-egosi ihe ị yi n'ime. Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-eji n'ihi nke a ghara igbu oge iyi ọbante chaa chaa makana ha achọghị ka ndị onye ọbụla sị ha ""onye nwe pantị nọ n'iro"". N'agbanyeghi na a rụpụtachaala ụdịrị ọbante dị iche iche iji gbochie ụdịrị ọgbatughie a, gụnyere nke a kpọrọ 'thong' (na-fanye n'ike), 'seamless panties' (nke na-anaghị egosi eriri maọbụ akara ọbụla n'okpuru akwa) wdgz, ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ekwu na ọ kaara ha mma ịhapụcha iyi nke ọbụla ma ncha. 2) 'Ọ na-enye m nsogbu n'ike': Otu ihe ọzọ mere ka ụfọdụ ụmụnwaanyị na-agbara ọbante ọsọ bụ na ọ na-enye ha nsogbu maọbụ emekasị ha ahụ. Ụfọdụ ụmụnwaanyị ekwuola na oge mbụ ị ga-ekpebi na ị gaghị eyizikwa ọbante, ọ ga-adị gị ka ị gba ọtọ, mana ọ bịa mara gị ahụ, ị bido mesapụwa ahụ, ọ dịrịzịa gị mfe. Ụfọdụ kwuru na iyi ọbante na-enye ha nsogbu n'ike, mana ha yipu ya maọbụ kwụsị iyi ya, ikuku abaa ha ahụ, ọbara agagharịwa ha n'ahụ ọfụma, ọkachasị tupu ị rahụ ụra. 3) Ụfọdụ na-atụ ụjọ ọrịa o nwereike ikpalite: Ndị ahụike na-akọwa na ụdịrị ọbante i yi na ụdịrị akwa e ji kwaa ya nwereike ime ka nje (bacteria) wakpoo akụkụ ahụ ahụ ma bawanye. Ụdịrị akwa e ji kwaa ọbante nwereike igbochi ikuku na-abata n'agada, nke ga-eme ka ọsụsụ ju ma mụbawanye nke nwereike ibute nsogbu 'yeast'. Nje ndị ahụ na-enye ụmụnwaanyị nsogbu n'agada, ụfọdụ oge ọ na-akọ ezigbo ọkọ ma na-afụkwa ụfụ. Iyi ọbante pụtara na ị ga-asanụ ya mmiri, ndị ọrụ ahụike na-akọwa na iji ụfọdụ ncha dị aṅaa saa ọbante nwereike itinye gị na nsogbu Bacterial vaginosis (bụ mgbe ọnọdụ e ji kee ikpu gị gbanwere), n'ihi ụdịrị kemịkal dị na ya. Ọbante (ọkachasị nke akọchaghị akọ) nwereike itinye ụfọdụ nje dị aṅaa n'ime ike nwaanyị. O nwereike ịkpalite ihe Bekee kpọrọ 'skin irritation' nke ga-emerụ gị ahụ ma ị kọọ ya ọkọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61407215 +business Jeff Bezos: Ihe mere o ji pụọ dịka onyeisi ụlọọrụ Amazon "Onye bidoro ụlọọrụ Amazon ma bụrụkwa onye nke abụọ kacha nwee ego n'ụwa niile bụ Jeff Bezos ekwụọla na ọ ga-arịtu dịka onyeisi ụlọọrụ Amazon ma bụrụzịa onye na-achịkọta ndị isi ọrụ ụlọọrụ ahụ. Nkọwa ya bụ na nke a ga-enyere ya aka ịtinye uchu n'ihe ndị ọzọ dị ya n'obi. O kwuru sị, ""Nke a ga-enye m ohere itinye anya n'atụmatụ ọhụrụ ụlọọrụ Amazon ma nye kwa m ike itinye uchu n'ihe ndị ọzọ na-amasị m. Anaghị m ala ezumike nka, ike ga dị m karịa"". N'Akwụkwọ mgbasa ozi Bezos degara ndị ụlọọrụ Amazon niile ka o kwuru na ọ ga-etinye ịgba mbọ ya n'atụmatụ Day One Fund o bidoro n'afọ 2018 ma kewapụta ijeri dọla abụọ ịkwalite agụm akwụkwọ. O kwukwara na ya ga-ebido atụmatụ Bezos Earth Fund iji kwalite mbara ezi na eluigwe nke ọ wepụtara ijeri dọla iri. Ọ ga-eji ya bụ atụmatụ kwado ndị okammụta na eme nycoha ma na-agba kwa mbọ ịkwalite mbara ezi na eligwe. Bezos nwekwara ụlọọrụ Blue Origin nke na-akwado iji ụgbọelu pụrụ iche ezipụ ndị mmadụ mbara igwe. Bezos kwukwara na ọ ga-etinye uchu n'ụlọ ntaakụkọ Washington Post nke ọ zụtara nde dọla narị abụọ na iri ise n'afọ 2013. Onye bụ Jeff Bezos? Jeff Bezos onye gbara afọ iri ise na asaa bụ onye bidoro ụlọorụ Amazon nke na-ere ihe n'ịtaneti n'afọ 1994 n'ebe ụgbọala na anọ n'ụlọ. Ụlọọrụ Frobes ekwuola na ọnụego Jeff Bewzos bụ ijer dọla otu narị na iri itolu na isii na ụma anọ. Tupu ya na nwunye ya agbasaa, ha mụrụ ụmụ anọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-55915230 +business "Ekene Obayi: ""Abụ m nwaanyị Igbo na-achị ehi mana ihere anaghị eme m""" Ekene Obayi bụ nwaanyị ji ịchị ehi mere aka ọrụ na Nsukka dị n'Enugwu Steeti. Ọ hapụrụ asambodo o nwetere na Mahadum dịka onye nchọpụta ihe ọkpụ Bekee kpọrọ 'Archeology' wee chịwazie ehi. Ugbua Ekene sị na ya na-achọ ego ọ ga-eji zụta ala ebe ọ ga-eji rụọ ogige ụmụanụ bụ ebe ọ ga-ewe ụmụnwaanyị ibe ya n'ọrụ. Ọ sị na ọ kwadoghi ịchagharị ehi n'ụgbo ndị mmadụ bụ nke na-ebute nsogbu n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo. Ọ gwara BBC otu o sị chọọ ịgbanwe ajọ echichi ndị mmadụ gbasara ọrụ ịchị ehi na Naịjirịa. Ndị mere ihe onyonyo: Chioma Obianinwa na Nnamdi Agbanelo https://www.bbc.com/igbo/afirika-56570873 +sports WBC: Anthony Joshua a na-atụ Wilder egwu? "Ihe na-ewu na soshal midia kemgbe Deontay wilder na Tyson Fury kụchara ọkpọ bụ maka onye bụ ọkaibe n'ọkpọ. Ebe ụfọdụ na-eche na Anthony Joshua ga-adọpụ Deontay Wilder akwa n'ukwu ọkachasị ka Tyson Fury kụpụchara ya kpakpando n'anya. Ndị ọzọ na-eche na ọ bụ Deontay na-atụ Anthony egwu. Wilder n'onwe ya gwaburu ndị ntaakụkọ na ""ha enyela Joshua otito ntogbu na-egbu nwa nkita nke mere isi ji ebuzi ya"". Ndị nkwado ha na-ekwu dịka o si gbasa ha. Ebe ndị nke Wilder na-asị na ọ bụ ezie na Joshua na atụ ya egwu ndị nke Joshua na-ekwu na nke ahụ be ọkpụrụkpụ asị. Ụfọdụ n'ime ha na-ekwukwa na onweghị onye na-atụ ibe ya egwu kama na ha ekwetabeghị otu aga esi kee ego ha ga-akụta na ya bụ ọkpọ. Ha na-ekwu na ọ bụ ndị nchikọta Wilder bụ Shelly Finkel na onye ntuziaka ya bụ Al Haymon ka ọ ka njọ n'isi. Ndị a na-ekwu na anyaukwu mmadụ abụọ a ka njọ ebe ha na-achọ ka ekee ihe nrite ha nhata nha ma kụọ ya bụ ọkpọ na mba Amerika. Ọkpọ mbụ Wilder kuru bụ Pay Per View (PPV) bụ nke ya na Tyson Fury kụrụ. Nke a pụtara na ndị otu Joshua na-eche na o rubeghị ogo ka ya na ha kee ego ọkara. Ha sị na ha agaghị eji ya tunyere Anthony Joshua PPV ya rugoro otu nde kemgbe ya na Klitshchko kụchara ọkpọ na Apreelu 2017. Onwebeghị ndị katara ahụ n'ọkpọ ha na Wilder kụgoro ọkpọ na-abụghị nke ya na Tyson Fury nakwa nke Luis Ortiz. Ndị niile ha na Wilder kụbụru ọkpọ bụ ndị ""Cruiserweights"", dịka ndị a sị ekwu. Anthony Joshua akụọla ọkpọ 24 e merie ya n'otu, nweta ""knockout"" 21, ebe Deontay Wilder kụgoro ọkpọ 44 e merie ya n'otu ọ nweta ""knockout"" 41. Anthony Joshua ji nturuugo IBF, IBO nakwa nke WBA ""Super"" dịka ọ nụgoro ọgụ ụgboro iri abụọ omerichara. Wilder jibu nturuugo ọkaibe nke mbaụwa n'ọkpọ ruo ụbọchị 22 nke ọnwa Febrụwarị mgbe Tryson Fury napụrụ ya. Ọ bụ ihe ndị a kpatara ha ji kwusie ike na ọ bụghị ụjọ ka Joshua na-atụ. Ihe onyonyo ebe ajụrụ Athony Joshua onye ọ na-ahụ dịka ọgbatauhie n'ọkpọ, Joshua sị na ọ bụ Tyson Fury na-echu ya ụra. O kwuru na eneweghị onye nwere ike ị ma ihe Fury bu n'obi nke mere na ọ bụ ezigbo nsogbu nye ya. Kama Joshua ekwuola na ọ dị njikere ka ya na Tyson Fury lụọ ọgụ." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51610462 +entertainment Maria Chike BBNaija interview: Ihe nwa ada a kwuru maka Liquorose, Whitemoney na Pere "Maria so na ndị ọtụtụ mmadụ kacha hụ n'anya n'egwuregwu Big Brother Naija nke afọ a tupu e mechaa nye ya ọsọ. Nwaada a bụ onye Ubaa Emii dị na Owere-North bụ elelewe ejeghị ọrụ, mma ya na-aba n'isi. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, o kwuru na ọ gaara amasị ya ma ọ bụrụ na ọ nọruru na ngwụcha egwuregwu BBNaija. Oge anyị jụrụ ya mgbe ọ ga-alụ di, o kwuru sị: ""Achọrọ m ịgba akwụkwọ mana amaghị m ma achọrọ m ịlụ di."" Gịnị ka nke a pụtara? Were ntị gị gere ya. Ndị mere akụkọ a bụ Chimezie Ucheagbo na Nnamdi Agbanelo." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58524421 +health Thyroid disease: Ihe mere m jiri agba mbọ ka ndị mmadụ mata maka ọrịa a Iruoma Ofortube gbakere dịka ọ rịachara ọrịa thyroid (nke Igbo na-akpọ ọrịọ,maọbụ akị ọrịọ), bụ ọrịa ọtụtụ mmadụ aghọtaghị. Ndị mmadụ na-akpasịkwa ndị bu ọrịa agwa na-ezighi ezi na Naịjirịa. Ọ na-abụkarị amaghị maka ya na-eme ka ndị mmadụ na-asị na ndị na-arịa ọrịa bu amụosu. Ofortube na-agbazị mbọ ime ka ndị mmadụ mata maka ọrịa ọfụma. O hibere ngalaba na-agbasa ozi maka ọrịa ma na-akọwara ndị mmadụ maka ya nakwa na-eme ka ha nwete ohere ọgwụgwọ nakwa enyemaka ndị ọzọ ha chọrọ. Ndị mere akụkọ a bụ Uche Akolisa na Oyeyemi Mustapha. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58188000 +entertainment Redflags in Relationship: Gbawa ka ụkwụ gị ha ma ị hụ akparamagwa ndị a n'onye chọrọ ịlụ gị "Onye mmadụ lụrụ nwere ike ịme ka o nwee ogologo ndụ maọbụ nwụọ n'oge ya erughị eru dịka ndị okenye si ekwu. Na nso nso a, akụkọ gbasara mmekpa ahụ nke ezinụlọ gụnyere di na nwunye malitere wuwe na soshal midia nke bụ kwa izu ụka, kwa akụkọ butere ọnwụ tụmadị ụmụnwaanyị nọ na di. Naanị n'otu ọnwa April 2022, ka a nụrụla akụkọ maka nwoke a na-ebo na ọ mụnyere nwunye ya ọkụ nakwa ọnwụ Osinachi Nwachukwu bụ ọgụ egwu ụka ama ama, a na-atụ di ya aka na o gburu ya. Tupu ndị mmadụ amalite ịyị onwe ha maọbụ kwuwe okwu ịbanye alụmdi na nwunye, ọtụtụ na-enwe mkparịtaụka banyere ihe dị iche iche gụnyere: Ihe atọ a dị mkpa, mana ọ bụ ya na-eme ka mmadụ mara ma ọ ga-alụ ma ọ gaghị alụ? BBC Igbo jụrụ Obioma Ogakwu bụ ọkachamara n'ihe gbasara nwoke na nwaanyị, kedụ ụdị akparamagwa ị ga-ahụ ma gbaara onye gị na ya na-ekwu okwu alụm di na nwunye ajọ ọsọ? Ogakwu kwuru sị: ""Ọ bụghị ihe niile bụ maka ego, gịnị ka ị gaghị anabata dịka mmadụ ị bụ?"" ""Onye ọbụla nwere ihe na-eju ha afọ ha agaghị anabata ma onye ọzọ mee ha. Iji maa atụ, ọ bụrụ na ihe ị na-achọ n'onye ị chọrọ ịlụ bụ ezi akparamagwa, ya bụ na ọ bụghị onye ji ego ga-ebutere gị ụzọ."" ""Kedụ etu onye ahụ si eme maka ihe gbasara anamachọọrụ ma ọ bụrụ onye na-enweghi ọrụ?"" ""Ọ bụghị iwu na onye ahụ ga-enwe ego oge ụnụ zutere, mana ọ bụrụ onye na-agba mbọ ma nwee ezigbo nchekwube na atụmatụ, ọ gaghị ebu gị aka makana ọ ga-agbalị hụ na ihe na-aga nke ọma."" ""Ụfọdụ ndị si n'ezinaụlọ ebe ọ bụ nne ha na-akpa nri karịa nna, nwereike iwere ya na ọ bụ nwaanyị ha na-alụ ga na-akpa nri dịka ọ dị mgbe ha na-eto."" ""Ya mere na ị ga-agbado anya tụlee ma ezinaụlọ ya ọ dị etu ahụ, ma ụmụnne ya a na-akpa ụdịrị agwa ahụ ka ọ bụ naanị ya nwere nsogbu ahụ."" ""Kedụ etu o si anabata enyemaka gị? Iwe ọ na-ewe ya na ọ bụ gị na-eweta enyemaka ka ọ bụ ihe ọṅụ nye ya?"" E nwere enyi ya nke ị nwereike igakwuru ka ụnụ abụọ kpaa etu ụnụ ga-esi nyere ya aka? ""Ọ bụrụ na ọ naghị anabata enyemaka, ọ baghị uru na i tinyere isi n'ịyị ya bụ ọyị"". N'abali Epreelụ 8, 2022 ka akụkọ ọnwụ Osinachi Nwachukwu bụ oti egwu ụka ama ama bidoro wuwe na soshal midia. Ndị ma Osinachi malitere kwuwe na ọ bụ oke mmekpa ahụ di ya na-emekpa ya kpatara ọnwụ ya. Ndị uweojii mechara gaa nwụchie di ya bụ Peter Nwachukwu ma na-eme nnyocha ka ha mara ma aka ya adị n'ọnwụ nwunye dịka ụwa si ebo ya. N'otu ọnwa Epreelụ a, ka akụkọ maka etu otu nwoke akpọrọ Ben Ogudoro wuru na soshal midia, a na-ebo Ogudoro ebubo na ọ mụnyere nwunye ya bụ Chinyere Ogudoro na otu nwanne ya nwoke ọkụ mgbe ha na-arahụ ụra. E nwekwaala akụkọ ebe nwaanyị gburu di ya n'oge gara aga. Mana akụkọ a azaala otu ajụjụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ ihe ndị ị ga-ahụ wee mara na ezi agaghị na alụm di na nwunye ahụ ị na-akwado. Ihe so kpalite okwu a bụkwa otu nwaokorobịa kọrọ etu nwaanyị ọ na-achọ ihu ya siri wụọ ya n'ala n'ihi na o jighi ụdịrị ego ọ chọrọ. N'aka ọzọ, otu nwaada kọrọ akụkọ etu daada ya si kwụọ ụdọ ka ọ na-eche ka nwoke ọ lụrụ oge o nweghị ego mechara gbanwee ka ha lụchara ma bido ezinaụlọ. Ajụjụ ọtụtụ ndị wee bụrụzịa ""kedụ nke e mere meta ndị mmadụ?"" Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49489915 +sports Arsenal vs Chelsea: Egbe Arsenal agbakasiala Chelsea isi rie ha ka anụ Sallah Chelsea na Arsenal gwọrọ onwe ha ịba taa n'asọmpi iko FA n'ọgbọegwu nke Wembley dịka Arsenal gbagoro ya ugboro iri na atọ (13) ya, Chelsea nke ugboro itoolu (9). Ya bụ egwuregwu malitere n'ike na ebube dịka Chelsea nyere goolu mbụ ha na nkeji nke ise site n'aka Pulisic. Ọ dịka ya ha bụ oke iyi riru Pierre-Emerick Aubameyang nke bụ na ahụghị ụkwụ egwu ya anya n'ime nkeji iri abụọ n'isi amalitere bọọlụ ahụ. Mana chi Arsenal zara ha oku dịka e nyere ha penariti na nkeji iri abụọ na isii bụ nke Aubameyang nyere, mere ya bụ egwu jiri kwụrụ na 1-1. Ọ dịka Aubameyang o ji aghụghọ ghọta penariti ahụ maka na ahụ ya na nwoke ahụ emetuchaghị. Mana Chi ya zara ya ekpere. Ya bụ goolu mere ka Arsenal Kelie mezia ka Chelsea daa mba nwamgbe nta. Mana mgbe abatara ezumike, Chelsea lọghachitere n'egwu. Na nkeji nke iri anọ na itoolu Christain Pulisic meruru ahụ nke mere ejiri were Pedro gbawee ya. Aubameyang zakwara aha ya ụzọ na nkeji iri isii na asaa site n'itinye goolu ọzọ nke mere ya Arsenal 2 - 1 Chelsea. Ọkpa Aubameyang dị ọkụ na mgbe a. Ọnwụ ndị Arsenal gburu ka arụrụ aka na nkeji iri asaa na anọ mgbe Mateo Kovacic nke Chelsea gbatara 'red card' site na 'yellow' abụọ ọ nwetere. Mgbe ahụ, Chelsea ji mmadụ iri agba, Arsenal nwere mmadụ iri na otu. https://www.bbc.com/igbo/media-53623888 +health Coronavirus in Africa: Ahụhụ anyị na-ata n'inyocha ndị mmadụ ahụ maka coronavirus Ndị ọrụ ahụike na Saụt Afrịka akọwala ihe ha gabigara dịka ha na-agagharị inyocha ndị mmadụ ahụ maka ọrịa coronavirus. Otu n'ime bụ onye nọọsụ bụ Tshego Selona sị na tara ahụhụ dị iche iche n'oge nyocha a nke gụnyere ịgbahapụ ezinaụlọ ha, ibute coronavirus, ọnwụ na ihe ndị ọzọ. Ọ sị na ndị mmadụ na-asọ ha asọ maka na ha nwereike ibunye ha ọrịa coronavirus. Selona sị na ga anaghị ehi ụra ọfụma n'abalị dịka ha na-agba mbọ ịgazu mpaghara ime ime obodo Saụt Afrịka. O kwukwara na ọtụtụ ndị ọrụ ahụike ibe ya nwụrụ n'ọrịa mana ọ gbakere na-agbanyeghi na o butere ọrịa a. Kirie ihe o kwuru n'uju: https://www.bbc.com/igbo/afirika-55124629 +religion Abakaliki Catholic Diocese: Etu ngaghari iwe e mere maka Fada siri gbaa ihe e zoro ezo n'anwụ "Kemgbe akụkọ gbara na ụfọdụ ndị ụka Katolik na Dayọsis Abakaliki, Ebonyi steeti, mere ngagharịiwe n'ihi nkwụsị ọrụ a kwụsịrị otu ụkọchukwu ha, ihe na-arịtụ na-arụtụ aka na mmiri agbarụọla n'ụlọụka. N'abalị 14 nke ọnwa Novemba afọ, 2021,ọtụtụ ndị ụka Katọlik wụjuru na 'Pastoral Centre Chaplaincy, Abakaliki' bụ be nnukwu Ụkọchukwu ha bụ Bishọpụ Peter Nworie Chukwu mee ngagharịiwe maka etu e si kwụsị Fada John Odey ọrụ n'ike. John Odey bụ ụkọchukwu na-achịkọta ụlọụka 'Holy Trinity Catholic Church', Umuoguduakpu, Otinyi-Ngbo dị n' Okpuru Ọchịchị Ohaukwu n'Ebonyi Steeti. Bishọpụ kwụsịrị ya bụ Fada ọrụ abalị ole na ole o bipụtachara akwụkwọ nke ọ kpọrọ ""The Hidden Truth and the Cloud of Witness"". N'ime akwụkwọ ahụ, Fada Odey dere, o boro otu ụkọchukwu aha ya bụ Fada Emmanuel Obuna ebubo,na ọ bụ ya nyụrụ ihe na-esi na dayosis Abakiliki ihe ruru iri afọ atọ. Fada Emmanuel Obuna rụburu ọrụ dịka Odeakwụkwọ Bishọpụ Michael Okoro bụ Bishọpụ na-achịkọtabu dayosis ahụ ,onye larala ezumike nka. N'ime akwụkwọ ahụ dị ibe 479,John Odey depụtachara ihe ndị megara oge niile Bishọp Okoro nọ n'ọkwa nke o jiri rụọ Fada Emmanuel Obuna aka dịka onye na-ekpe ma na-ebi okwu na dayọsis ahụ. O kwukwara na Emmanuel Obuna anaghị ekwe ka ndị ụkọchukwu ndị ọzọ rue Bishopụ nso. Akwụkwọ ahụ kọwakwara ihe butere nghọtahịe nke mere ka Bishopụ Michael Okoro kwụsịbuo Fada Odey ọrụ n'ike n'afọ 2009. Ngwa ngwa akwụkwọ ahụ nke e wepụtara n'ọha n'abalị 23 nke ọnwa Oktoba, afọ 2021, pụtara ihe, ebe niile nwuuru ọkụ na dayọsis ahụ, nke mere ka Bishọpụ Chukwu kwụsị Fada Odey ọrụ n'ike, Mana nke a kpasuru ọtụtụ ndị ụka Katọlik ihe Fada Odey na-amasị iwe, nke mere ka ọtụtụ mee ngaghariiwe, ebe ụfọdụ dere ozi na-akpọ oku ka a kpoghachi ya na-egbughị oge. N'ozi ha degaara Bishopụ Chukwu n'ọha nke rutere BBC Igbo aka, ha jụrụ ya ihe kpatara o jiri nye Fada Odey ikike ka o bipụta akwụkwọ ahụ, mechaa tụgharịa taa ya ahụhụ na-erubeghị otu izuụka akwụkwọ ya pụtara. Akwụkwọ ozi ahụ kwuru: ""Ihe a tụrụ anya n'aka gị bụ ihibe kọmiti ga-elebanye anya n'ebubo ndị Fada Odey boro tupu. Ị mara ihe ị ga-eme ya,"" ""Kama ịta ya ahụhụ na-enyochaghị ihe kpatara ya bụ akwụkwọ bụ ime uche ndị na-ememila ụka."" Ha dọrọ aka na ntị na ọ bụrụ na ụka Katọlik na Naijiria amaghị hazie okwu metụtara Bishop Okoro na Fr. Dr. Emmanuel Obuna, na ihe mere n'Ahịara Katọlịk Dayosis ga-eme na dayọsis ha. Cheta na Ahiara dayọsis bụ ebe ndị ụka na ndị ụkọchukwu jịkọrọ ọnụ jụ ịnabata Bishopu Okpaleke bụ Bishọpụ ọhụrụ e nyere ha. Ndị ahụ mere ngagharịiwe kwuru na ọ bụrụ na a kpọghachi Fada Odey n'ọrụ, na ha, ga-agba n'anwụ mpụ ụfọdụ ndị ụkọchukwu merela na dayọsis ahụ dịka ndị na-edina ụmụnwaanyị nọ na di, ndị na-emetọ ụmụaka, ndị na-ete ụmụnwaanyị ime na ndị nwere ọtụtụ ụlọ na akụnụba. Mana ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ebere Fada Odey na-arụ a kpọrọ 'Father John Odey Centre' agọọla na aka Fada Odey adịghị na ngagharịiwe ahụ ndị mmadụ mere. Oge a kpọrọ ya, Fada Obuna gwara BBC Igbo n'ekwentị na ya agaghị asa ihe ọbụla banyere ebubo niile Fada Odey boro ya n'akwụkwọ o dere. O kwuru sị: ""Okwu ahụ eruola Rome. Na ụka Katọlik, okwu ruo Rome, ọ dịka okwu dị n'Ụlọikpe Kachasị, agaghị m etinyenwuzi ya ọnụ."" Mbọ BBC gbara ịnụta uche Bishopụ nakwa Ụka Katọlik na Dayosis Abakiliki amịtaghị mkpụrụ. Oge onye ntaakụkọ anyị kpọrọ odeakwụkwọ dayọsis ahụ bụ Fada Henry Ogodo na-ekwentị, jụọ ya maka ebubo a na-ebo dịka o siri metụta Fada Odey, o kwuru na ya enweghị ike ịsa ya n'ihi na ya na-anya ụgbọala. O kwuru na ya ga-enye ọsịsa ya ụbọchi Fraide mana oge BBC Igbo kpọghachiri ya, ọ zaghị ekwentị ya. N'aka nke ọzọ, mbọ inweta Fada Odey amịtaghị mkpụrụ dịka a gbanyụrụ ekwentị ya agbanyụ. Otu onye maara Fada Odey kemgbe afọ iri atọ bụ Benedict Okoro gwara BBC Igbo na nsogbu Fada Odey nwere bụ na ọ bụ onye na-ekwu okwu gbowam, na-atụghị egwu onye o metụtara. O kwuru na Fada Odey dere ihe ọtụtụ ndị ụkọchukwu nakwa ndị na-ekpe ụka Katọlik ma mana egwu ekweghị ha ekwupụta ya. Bennet kwuru sị,""Fada Odey amaghị atụ asị. Nke mere na ọ naghị ezo ọnụ ikwu okwu megide ihe o kwenyere adịghị mma.""" https://www.bbc.com/igbo/59334377 +health Etu ihe esere si enyere Aziza nwata nwere 'Autism' aka Nne na nna Aziza,nwata nwere 'nsogbu 'Autism Spectrum Disorder bụ ASD n'ịchafụ kọwara etu nwa ha na ọnọdụ ahụ si aga. Ngalaba WHO kọwara ASD dịka ọnọdụ dị iche iche nke na-egosipụta site n'ịme ka mmekọrịta na ụzọ ịkparịta ụka n'ụzọ dị iche iche siere mmadụ ike. N'aka nke ọzọ ka ngalaba na-ahụ maka ahụike mba Briten bụ National Health Service bụ NHS n'ịchafụ kwuru na ASD abụghị ọrịa ma ncha. Akụkọ a bụ maka Aziza bụ nwa nere ọnọdụ ASD. Ha kwuru ihe ịma aka nwa ha na enwe Nwa ha nwere ihe bekee na-akpọ Autism Spectrum Disorder. Dịka Eziafakakụ Nwokolo onye na-ahụ maka agwa kọwara ụfọdụ ihe eji amara onye nwere ọnọdụ ASD - 1) O kwuru na nke mbụ bụ na onye ahụ agaghị enwe ike ile mmadụ ọzọ anya na mkpụrụ anya 2) Nwokolo kwuru na ọzọ bụ na ha anaghị anọ otu ebe 3) O gụnyere na ụfọdụ anaghị ekwe aza aha ha maọbụ nwee mmekọrịta ha na mmadụ ọzọ 4) O si kwa na ụfọdụ ụmụaka nwere ya anaghị enwe ike iji ihe ụmụaka ibe ha ji egwu egwu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-61103977 +health Covid-19 Vaccines FAQ: Ajụjụ niile i nwere maka ọgwụ mgbochi covid-19 "N'ụbọchị abụọ nke ọnwa Maachi ka ọgwụ mgbochi si n'otu COVAX nakwa ụlọọrụ Astrazeneca tụrụ ụkwụ na Naịjirịa. Dịka ụbọchị ole na ole gara, onyeisiala Muhammadu Buhari nakwa osote ya bụ Yemi Osinbajo gbara ọgwụ ahụ n'ihu ala niile iji gosi na-onweghi ihe ọjọọ dị na ya. N'agbanyeghị nke a, ọtụtụ ndị mmadụ ka chị obi ha n'aka maka ọgwụ a ma na-atụ ụjọ maka ihe o nwereike ịme. Anyị edetuola ụfọdụ ajụjụ a ma za kwa ya iji kasie ndị mmadụ obi. Ụlọọrụ a kpọrọ National Primary Health Care Development Agency ewepụtala usoro ị ga-eji denye aha gị n'igwe kọmpụta. Ị nwekwara ịke ịhọrọ ebe ị chọrọ ị gba ya bụ ọgwụ nakwa ebe dị nso na be gị. Dịka ọ dị ugbua, ihe karịrị mmadụ nde abụọ edenyela aha ha ịgba ọgwụ a. Gọọmentị etiti akpọpụtabeghi ego ole ọ ga-ewe mmadụ iji nata ọgwụ mgbochi a. Kama ha kwuru ka ndị ọrụ ahụike nakwa ndị okenye na ndị ọrịa na-arịa gbaa mbọ hụ na ha wetara onwe ha ebe a na-agba ọgwụ a. Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garbe Shehu kwuru na o nweghi ihe ọbụla merela onyeisiala mgbe ọ gbachara nke ya. Mana gọọmentị mba Briten kọwara na o nwere ụfọdụ ngosi mmadụ nwereike ị nwe ga-ejikwa aka ya kwụsị n'ime otu izu Ha gụnyere: ike ọgwụgwụ,isi ọwụwa, ịgbọ agbọ, ịkọ ọkọ n'ebe agbara gị ọgwụ, ọkpụkpụ ịgbu mgbu, ahụ ọkụ ndz. Enwerem ike ibute ọrịa covid-19 ọzọ ma m gbachaa ọgwụ a? O dobeghi anya ma nke a enwereike ịme n'ezie mana ngalaba ahụike mbaụwa niile bụ WHO kwuru ka ndị mmadụ jide ka ha ji. Nke a pụtara ""kpuchie imi gị, kwọọ aka gị, dopu onwe gị iche ganye mgbe mpụtara ga-egosi na ọgwụ mgbochi achụlaala covid-19 kpam kpam. - Anaghị agba ụmụaka ọgwụ a - Ọgwụ mgbochi a enweghi nje coronavirus n'ime ya dịka akụkọ ụgha si kwuo. - Amabeghị ma ọ na-ekpuchi ndị mmadụ n'ebe ụdịrị ọhụrụ ọrịa a dị (dịka mba UK na mba Saụt Afrịka)" https://www.bbc.com/igbo/afirika-56327058 +business Fuel scarcity: Ihe ndị mmadụ na-eme dịka ụkọ mmanụ ụgbọala rutere Ọwụwa Anyanwụ Ndị bi n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjiria akọwaala etu ụkọ mmanụ ụgbọala si emetụta obibi ndụ ha kemgbe ọ malitere. Ha gwara BBC na ebe ụkọ mmanụ ụgbọala a si ka njọ bụ na e nweghi kpọmkwem ego ole bụ ihe a na-ere ya. Ụfọdụ n'ime ha kwuru na ego ahụ na-arị elu na-arịda ụfọdụ oge, ebe ndị ọzọ kwuru na ọ na-ara ahụ ịhụ ebe ha ga-agbata ya bụ mmanụ ụgbọala. Ụfọdụ kwuru na ebe o si ka njọ bụ na ha anaghị enwe ọkụ latrik, nke bụ na ị na-achọghịgodu ịpụ n'ụlọ maka ụkọ mmanụ, ị ga-achọrịrị nke ị ga-eji mụọ ọkụ n'ụlọ. Ndị bi n'Owerri, isiobodo Imo steeti nakwa Abakaliki nke Ebonyi steeti kwuru na ụkọ mmanụ a emeela ka ego njem ụgbọala tinye ego. Ndị bi n'Enugwu kwuru na ha na-atụ ụjọ ka ha ghara ịzụta ma gbanye mmanụ adịgboroja n'ụgbọala ha, dịka ha kwukwara na ha na-ata ahụhụ ịzụta mmanụ ụgbọala ugbua. Mara na ụkọ mmanụ ụgbọala a malitere na Legọs na Abuja n'ụbọchị asaa nke ọnwa Febrụwarị 2022, dịka gọọmentị etiti kwuputere na mmanụ adịgboroja e bubatara Naịjiria efesaala, ma mechaa kwuo na ha na-agba mbọ iweghachịte ya n'aka ọdọmmanụ ụgbọala ndị ọ banyere n'aka. Ya bụ ụkọ mmanụ eruteghi mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ruo na ngwụcha Febrụwarị/mbido Maachị. Gee ihe ndị mmadụ gwara BBC n'uju: https://www.bbc.com/igbo/afirika-60610872 +entertainment Cameron Boyce: Ọnwụ ya agbawala ụwa obi Ezinaụlọ Cameron Boyce ekwuputela na nwa ha nwoke bụ ntorobịa na-eme ihe nkiri ama ama n'ụlọrụ Disney anwụọla. Ọnụ na-ekwuchitere ezinụlọ ahụ kwuru na Boyce nwụrụ n'ụra ya ka akwụkwụ dọchara ya. Boyce malitere ime ihe nkiri ya n'ejije akpọrọ 'Mirrors' mana eji ihe nkiri ọ na-eme na Disney wee mara ya. Ọ bụ n'abali isii nke ọnwa Julai ka ekwuputere maka ọnwụ ya ma na-arụtụ aka na ọrịa na-arịabụ ya tupu ọnwuọ. Ihe ndị ọzọ ikwesiri ịma maka Cameron Boyce @sushiking28 kwuru na ọnwụ Boyce gbawara obi ya. @gabriiellann kwuru na o cheta ka Boyce si makụọ nne ya ụbọchị ụkanne, ọnwụ ya na-agbawa ya obi. @minyugenn kwuru na onweghị onye ga-adị ka nwanne ya nwoke a bụ Cameron Boyce nwụrụlanụ. @VictoryxoxFan kwuru bụ nnukwu onye ama ama n'ejije nke a mere ka obi gbawa ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48898754 +sports Chelsea vs Liverpool: E zila Chelsea na ọ bụghị naanị chịngọm na-ere eze Ndị Liverpool gosiri Chelsea na ha ka ga-akwụnwu ụgwọ isi ha dịka ha meriri ha na Stamford Bridge. Liverpool asọghị anya na ha nọ na be Chelsea, wee bie ha aka n'ala ma nara ha pọịntị atọ wee lawa. Goolu abụọ ha ji merie Chelsea si n'ụkwụ Sadio Mane na nkeji 50 nakwa 54. Chelsea tara ahụhụ karịa Job nke akwụkwọ nsọ dịka Liverpool ekweghi ha kute ume ndụ, ọkachasị mgbe a chụpụrụ Andreas Christensen. N'agbanyeghi na Chelsea mefuru nde paụnd narị abụọ iji zụta ndị ọgbabọọlụ ọhụrụ n'afọ ọhụrụ a, ọ zọpụtaghị ha. Ọkachasị etu Kepa Arrizabalaga bụ oche goolu si wee na-agba ọnyụpa n'ọgbọegwuregwu. Chelsea mechara nweta penariti, mana Jorginho gbanyere ya n'aka Alisson na-echere ndị Liverpool goolu. Ka ọ dị ugbua, Chelsea ga-ezute Barnsley n'asọmpi Iko Carabao n'ụbọchị 23 nke ọnwa Septemba, tupu ha ezute West Brom n'ụbọchị 26. Ebe Liverpool ga-ezute Lincoln City n'ụbọchị 24 nke ọnwa Septemba n'asọmpi Iko Carabao, tupu ha na Arsenal akwata ya n'ụbọchị 28. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-54228870 +politics Ipob asaala George Obiozor nke Ohanaeze Ndigbo maka okwu ọ gwara Nnamdi Kanu "Ndị ọkaiwu Ipob gụnyere Aloy Ejimakor na Paul Achalla asaala onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ George Obiozor n'okwu ọ gwara Nnamdi Kanu bụ onye ndu Ipob. Obiozor mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Enugwu sị na ""Okwu Biafra karịrị Nnamdi Kanu ikpebi"". Na nzaghachị ndị ọkaiwu Ipob katọọrọ ihe Obiozor kwuru mgbe ha na BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'ekwentị. Aloy Ejimakor sị na ọ tụghị anya na Obiozor ga-ekwu ụdị okwu a maka na Nnamdi Kanu abụghị obere nwa, na ọ karịala afọ iri ise. Ọ sị na okwu Biafra abụghị ihe gbasara Ohanaeze Ndigbo maka na ha abụghị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị kama na ọ bụ otu omenala na-ahụ maka ọ dị mma ndị Igbo. Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghi ihe Ipob nwere megide onyeisi ọhụrụ Ohanaeze Ndigbo kama na ha ekwesighị ị na-akpụ Ipob na Kanu n'ọnụ mgbe niile. N'okwu nke ya, Paul Achalla sị na Obiozor hapụrụ ihe o kwesịrị ikwu metụtara mmegbu ndị Igbo, mwakpo ndị Fulani na-achị ehi nakwa nchekwa n'ala Igbo ma kwuwe maka Biafra na Ipob. Achalla kwukwara na Nnamdi akwụghị naanị na mbọ inwete Biafra na ọtụtụ ndị Igbo nwere agba so ya n'azụ. Ọ gara n'ihu kwuo na Ohanaeze bụ ọgbakọ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị si ala Igbo ji ala ezumike nka na ha na anaghị eme ihe ga-abara ndị Igbo uru. Achalla nyere Obiozor ndụmọdụ ka ọ hapụ ịgbaso ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma lekwasị anya maka ọ dị mma ndị ntoroọbịa, ndị nne nakwa Igbo gbaa gburugburu. Ihe ndị ọzọ Obiozor kwuru:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-55749581 +politics 2023 Presidency: Ihe Tinubu kwuru maka 2023, Buhari na 'third term' "Onye ndu otu APC bụ Bola Ahmed Tinubu gara zute Onyeisiala Naijiria bụ Muhammed Buhari n'obi gọọmenti etiti bụ 'Aso Rock n'ehihie Tuzde, were kwuo na Buhari enweghị ebumnobi ọbụla ịzọ oche ahụ nke ugboro atọ. O kwuru na ndị ọbụla ha na Buhari rụkọrọla ọrụ mara na ọ gaghị akpa iwu Naijiria aka iji nweta ohere ịchị agba nke atọ (Third Term) Ọ gara n'ihu kwuo na chi ka bụ ụtụtụ ikwu maka onye ga-abụ onyeisiala n'afọ 2023. Inec, gbaa mbo mee mmeju ntuliaka kwụ ọtọ - Buhari Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari enyela Inec iwu ka ha gbaa mbọ hụ na mmeju ntuliaka ndị enwere gara nke ọma, na-enweghị wuruwuru ọbụla. Buhari nyere ntụzịaka oge Yakubu du ndị ọrụ ya gara leta Buhari nobi Gọọkmenti ụbọchị Tuzde. Buhari kwuru sị : A kwụsiri m ike na nkwado ntuliaka kwụ ọtọ. Ụmụ Naịjiria kwesịrị iwe ohere ịtụnyere onye masịrị ha na enweghị tigbuo-zọgbuo ọbụla."" Inec gbara onyeisiala ama na e kpechaala ikpe niile gbasara ntuliaka ndị kwesịrị ibi n'ụlọikpe mkpegharị. Cheta na e nwere steeti ebe a ga-ementuliaka nakwa mpaghara a ga-enwe mmegharị maọbụ mmeju ntuliaka. Onye gbagburu onye nwụrụ n'ọgbaghara dapụtara n'Imo steeti? Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ha na-esi imi n'ala ịmata onye gbapụrụ egbe gburu otu onye ka ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị na-azọ oche ọchịchị imeobodo na steeti ahụ. Ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Orlando Ikeokwu, gwara BBC Igbo na ọgbaghara a dapụtara ka ndị isioche okpuruọchịchị imeobodo 27 e wepụburu ewepụ gara n'okpuruọchịchị ndị ahụ kwuo na ha chọrọ iweghara ọchịchị. Ha gbadoro aka na mkpebi ụlọikpe kachasị nyere n'isi Ekiti steeti, wee gaa iweghara ya bụ ọchịchị n'ihi na ha chere na ọ bụ otu mkpebi ahụ metụtara ha; mana ha zutere ndị uweojii bịara ịhụ na ihe niile gara n'anya ya - na-enweghi nsogbu ọbụla. Mana nsogbu dapụtara ka ndị jibu ọchịchị na ndị a bịara ịnara ọchịchị malitere ise okwu n'okpuruọchịchị Isu, a gbaa mmadụ abụọ egbe, mana otu onye nwụrụ ka e bugara ha ụlọọgwụ. Ikeokwu kwuru na ndị nke Imo steeti echeghi ka mkpebi ikpe nke ha pụta n'ụlọikpe, tupu ha azọwa onye ga-anọ n'oche, nke bụ ihe butere ọgbaghara a. N'etiti ndịagha na Gọvanọ Babagana Zulum Ndị agha Naijiria asaala Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum okwu n'ebubo o boro n'ihe onyonyo fegharịrị na nso nso na ndị agha na-ana aka azụ n'okporoụzọ ma kwuo na ha ga-ama imi n'ala inyocha ndị mere ya bụ ihe. N'otu aka ahụ, ha rịọrọ ka onye ọbụla nwere ụdị mkpesa ahụ kpọtụrụ ha, kama ịgba ha otele n'anwụ etu ahụ. N'ofesi, Mmadụ iri anọ anwụọla ka ndị mmadụ na-ekwo ekwo ebe ha pụtara akwamozu Qasem Soleimani, bụ ọchịagha ndịagha Qud Force nke onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nyere iwu ka e gbuo, na mba Ịran. Egwu ga-ada na Manchester Pep Guardiola ekwuola na enweghi ihe ga-eme ka ọ chịkọta ndị Manchester United maọbụ Real Madrid. Nke a na-abịa dịka Manchester City bụ ndị ọ na-achịkwa, na Man Utd ga-akụkọta mpi n'Iko Carabao n'abalị Tuzde a. Ndị uweojii na Kano anwụchiela otu nwaanyị Hauwa Lawal kwanyere nwunye di ya na nwa o ku n'aka n'ime olulu mmiri. Ndị uweojii kọwara na ọ bụ esemokwu ezinaụlọ ka o ji kpaa mkpamkpa ahụ. A kpọpụtara Zuwaira Sani n'olulu ahụ mana o mechara nwụọ n'ụlọọgwụ ebe nwa ya nwoke natara ọgwụgwọ. Ndị Naịjirịa ọ bụ gịnị? Ị ma na aha Naịjirịa pụtara dịka obodo kachasị e le ndị na-enwe mmekọ n'Intaneti dịka ụlọọrụ Pornhub si kwuo. Onye ọkammụta n'ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị ekwuola na ụmụ Naịjirịa na-eme mara mara n'ihu gwọmpịtị n'azụ. Gụọ ya n'uju ebe a: Lee ọkwa Naịjirịa nọ n'obodo ndị kacha achọ ụmụnwaanyị gbaa ọtọ N'ofesi Ihe karịrị mmadụ iri atọ anwụọla na nzogbu nzogbu malitere n'akwamozu Qassem Soleimani bụ ọchịagha mba Iran. Cheta na Soleimani nwụrụ mgbe ogbunigwe mba Amerịka zipụrụ tụrụ ya. N'egwuregwu, Ngalaba na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF n'aha ịchafụ ebunyela ọgba bọọlụ Super Eagles Success Isaac ụkpa ekele dịka taa bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ ya. Gọọmentị Bauchi steeti ekwuola na ha chọpụtara ihe karịrị mmadụ nari ise nwụrụ anwụ ka na-anata ụgwọ ọnwa na steeti ahụ. Ha kwuru na nke a gbara n'anwụ mgbe ha malitere ịme nyocha ndị ọrụ na Bauchi steeti. Ndị uweojii n'Enugu anwụchiela ndị otu ha atọ nke a hụrụ n'ihe onyonyo ebe ha na-enye otu onye ntorobịa nsogbu maka ekwentị ya. Ha kọwara na ha ga-ekpe ha ikpe imeụlọ ma kwuo na ndị uweojii anaghị akwado mwakpo ndị mmadụ n'ụzọ ọbụla. Anyị kwụ chị m n'Iraq! Ọ bụ gọọmentị mba Amerịka ebe ha na-agọpụ aka na ụkwụ ha n'akwụkwọ ozi na-efegharị na-ekwu na ha na-achọ ịkpọpụta ndị agha ha ebe ha nọ na mba Iraq. Cheta na ndị omeiwu mba Iraq na-akpọ oku ka ndị agha mba Amerịka kwara laa n'ihi ọgbaghara ha sunyere na mba Iran dị n'akụkụ ha. Ọ dị ka Arsenal ekuliela n'ụra ugbua Ha ji otu ọkpụ goolu merie Leeds mgbe ha zutere onwe ha n'agba nke atọ n'asọmpị Emirates FA Cup Ha ga-ezute Bournemouth n'agba ọzo n'Abia. Gee akụkọ n'ime otu nkeji ebe a" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51005229 +entertainment Ụmụ nwoke ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nwereike ịbụ 'Super Model' "Oge ndọrọndọrọ ebirila ọkụ na gburugburu Naịjirịa dịka a na-akwado ime ntuliaka ọkwa Onyeisiala, Gọvanọ nakwa ụlọomeiwu dị icheiche n'afọ 2023. N'oge a, e nwere ndị a ma ama aha ha na-ewu maka ndọrọndọrọ ma nwee ndị ọzọ aha ha na-ewu maka ịchabanye ụmụnwaanyị n'anya. Ihe ndị a ji bụrụ ọpụrụiche ebe ndị ọzọ nọ gụnyere mma nwoke ha, ogo ha toro nakwa etu ha sị acha. Igbo na-ekwu na ""ahụ dimkpa ahụ ogologo imi ya"", soro anyị n'akụkọ a ka anyị gosi gị ndị bụ olu gbajie 'girls'. Osita Benjamin Chidoka a ma dịka Ike Obosi bụ otu onye na-amasị ụmụ nwaanyị. Ọ bụ onye Obosi dị n'Idemili North Anambra steeti. Ọ bụbu Minista njem ụgbọelu n'okpuru Olusegun Obasanjo ma mechaa bụrụ onyeisi na-elekọta ngalaba ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ. Ọ zọrọ ọkwa Gọvanọ n'afọ 2017 mana Willie Obiano nke APGA meriri ya. O nwebeghi ọkwa ọ na-azọ ugbua. Idris Ajimobi bụ naanị nwa nwoke aka chịbụrụ Oyo steeti bụ Abiola Ajimobi mụtara. O si Ibadan bụ isi obodo Oyo steeti. Idris gụrụ akwụkwọ na mba ofesi ma laghachite malite ụlọọrụ ya na-ere ma na-elekọta ụlọ na ala. Ọ lụrụ nwa ikpeazụ Gọvanọ Kano steeti bụ Umar Ganduje akpọrọ Fatima Ganduje ma zọta ikike ịnọchị anya otu APC n'ụlọọmeiwu steeti Oyo. Chima Emmanuel Obieze bụ ọkwaiwu si Akama-Oghe dị n'okpuruọchịchị Ezeagu dị n'Enugwu steeti. Dịka o si kọ, ọ tara ahụhụ mgbe ọ na-etolite n'ihi na nne na nna ya enweghi ego mana ọ gbalịrị mepụta onwe ya ihe. Ugbua ọ bụ onye omeiwu nọchitere anya mpaghara Ezeagu ma bụrụkwa onyeisioche Kọmiti ndị ụlọomeiwu na-elekọta ụlọ na ala. Gbadebo Rhodes-Vivour bụ onye ji ego achụ ego zọburu ọkwa dị icheiche na Legọs. Nna ya bụ ọkaikpe a ma ama bụ Bode Rhodes-Vivour lara ezumike nka ugbua. Ọ malitere njem ndọrọndọrọ ya na KOWA pati mgbe ọ zọrọ onyeisioche okpuruọchịchị Ikeja. Ọ mechara banye PDP ebe ọ zọtara ikike ife ọkọlọtọ ha n'ịzọ oche ụlọomeiwu ukwu n'afọ 2015. Ọ pụtara ịzọ ikike iji aha PDP zọ ọkwa Gọvanọ Legọs steeti mana ọ mechara pụọ n'otu ahụ banye n'otu Labour Party ịzọ otu ọkwa ahụ. Bankole Wellington bụ otiegwu a ma dịka 'Banky W' si n'iti egwu zọwa ọkwa. O malitere iti egwu kemgbe afọ 2002 ma mepekwa ụlọegwu nke ya akpọrọ 'Empire Mates Entertainment' bụ E.M.E. Ọ lụrụ omeeiheonyonyo bụ Adesuwa Etomi n'afọ 2017. O bu ụzọ kwuo na ọ ga-azọ nnọchi anya Eti-Osa Federal Constituency n'ụlọomeiwu nta n'okpuru otu Modern Democratic Partu n'afọ 2018 nke Babajide Obanikoro meriri ya na ya. Ugbua ọ na-azọ otu ọkwa ahụ mana ọ bụ n'okpuru otu PDP dịka ọ ritere ikike iji aha ha zọ ya bụ ọkwa n'ọnwa Juun afọ 2022. Ibenaku Onoh malitere iwu mgbe ọ bụ onye kachasị dị na nwata zọtara ọkwa n'ụlọomeiwu Enugwu steeti. Ọ bụ ọkaiwu gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka. Onoh ruburu ọrụ na ụlọakụ etiti bụ Central Bank tupu ọ zọọ ma banye n'ọkwa. Ọ zọtara ikike ịnọchi anya otu PDP n'ụlọomeiwu Enugu steeti nke o meriri n'afọ 2019. Onoh na-azọgharịkwa ọkwa ya ọzọ na ntuliaka na-abịa n'afọ 2023. Umar Ganduje bụ nwa Gọvanọ na-achị Kano steeti bụ Abdullahi Umar Ganduje. Ọ bụkwa ọgọ nwoke Idris Ajimobi na-alụ nwanne ya nwaanyị nke obere. Ganduje esorola nzọmụkwụ nna ya site n'ịzọ ọkwa n'okpuru otu APC nke o ritere ikike ya na ntụliaka imeụlọ e mere n'ọnwa Mee. Ọ na-achọ ịnọchị anya Tofa, Rimin Gado, Dawakin Tofa n'ụlọomeiwu nta maọbụrụ na o merie na ntuliaka na-abịa n'afo 2023." https://www.bbc.com/igbo/articles/cqqd5gzv9z3o +health Gastroenteritis: Gịnị bụ ọrịa a na-ata n'afọ na-egbusisi ndị mmadụ n'Ebonyi "Ọrịa otoro a na-enyo nwere i bụ ihe Bekee kpọrọ ""gastroenteritis"" egbuola mmadụ itolu n'obodo Ndiegu Amagu dị n'okpuru ọchịchị Ikwo n'Ebonyi steeti, dịka otu onye ọrụ gọọmentị siri kwuo. Nke a na-abịa dịka kepụ kepụ pụtara na ndị mmadụ na-anwụ aghara aghara n'okpuru ọchịchị Ikwo. Ụfọdụ akụko a na-ekwu na ndị nwụrụ site n'ọdachị a eruola 65. Mana, otu n'ime ndị enyemeka onyeisi okpuruọchịchị Ikwo bụ Ugonna Utulor depụtara n'akwụkwọ ozi n'ụbọchị Tọọzde were kọwa na ọnụ ọgụgụ ndị a abụghị eziokwu. Maazị Utulor kwuru na akụkọ ndị na-efeghari na soshal midia na mmadụ iri isii na ise nwụrụ n'ọrịa bụ akụkọ ụgha. Mana, o kwukwara na o bu eziokwu na ọrịa afọ gburu ndi mmadụ n'obodo Ndiegu Amagu na mbido ọnwa Nọvemba. Maazị Utulor sị na dịka ọdachi a mere, ha ezigarala ngalaba ahụike steeti, nke okpuruọchịchị, otu ahụike mba ụwa bụ WHO n'ịchafụ na ndị isi okpuruọchịchị Ikwo ozi banyere ọrịa a. N'okwu ya, ọ sị ""Ngalaba ndị a zitere anyị ndị ��rụ ahụike, ha nnyochara ime ahụ ọtụtụ ndị obodo anyị mana e kwuru na ọ bụghị otoro kpọmkwem."" Akwụkwọ ozi ya kwukwara na ndị ndu okpuruọchịọchị ahụ agbaala mbọ zụta ọgwụ, bute ihe eji echekwa mmiri ọṅụnụ, nakwa ihe ndị ọzọ e ji enyere ndị afọ na-asa aka. Ọ gara n'ihu kwuo na mgbe ha mere ọnụ ọgụgụ n'ụbọchị Tọọzde bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Nọvemba, 2021 na ndị nwụrụla n'ọrịa bụ mmadụ itolu. Ọ sịkwa na mmadụ iri na asatọ (18) butere ya bụ ọrịa ahụ anatala ọgwụgwọ, ebe mmadu iri n'ime ha agbakeela. Gịnị bụ ọrịa ""gastroenteritis"" a na-enyo n'okwu ọnwụ ndị a? Ọrịa a na-akpọ ""gastroenteritis"" na-eme ka afọ na-ata mmadụ nke ukwuu. Dọkịnta Udodi Kachikwuru Okoli gwara BBC Igbo na ọrịa a na-akacha e si na mmiri a nesighi esi nwee ṅṅọọ maọbụ a na-etinyeghi ọgwụ e ji eme ka mmiri di ọcha. Ọ kwuru na mmadụ iri nrị aghara aghara ọ na-amaghi ebe maọbụ etu e si sịe ya bụkwa ụzọ ọzọ esi ebute ọrịa. N'okwu ya, Dkt Okoli kwuru na ụmụaka ndị okenya bụ ndị kacha e bute ọrịa maka ime ahụ ha esighị ike ka nke ndị ntorobia. Mgbe ụfọdụ ndị butere ọrịa na-enwe afọ mgbu. Dọkịnta Okoli kwuru n'ebe a na-akacha ebute ọrịa a bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ bịkọ ọnụ maọbụ na-anọkọ ọnụ dịka ụlọezụmịke ụmụakwụkwọ, ebe ndị agha na-ebịkọ, ụlọ nga, ụlọọgwụ, ndị bịtere aka n'ime ụgbọ mmiri nakwa ndị nwere ọrịa n'ime ahụ ha. Dkt. Okoli kwukwara na ""Oria a nwereike ikpalite ahụọkụ, ịgbọ agbọ, otoro ịgba mmadụ maọbụ mmadụ ịnyụ nsi ị bụ ihe na-adịghị mfe"" Ọrịa a na-efe efe site na onye ahụ dị mma na onye bu ọrịa a ịnọkọ, ịrịkọ nrị ọnụ, dịka nje ọrịa a na-esi na nsị maọbụ agbọ onye bu ọrịa efesa onye ọzọ. Ya mere na-etu e si ezere ọrịa a bụ site na ihichasi na nzacha ụlọ ọbịbị nakwa ebe a na-esi nrị, ịkwọ aka kwa mgbe, kwa mgbe, ezere ndị bu ọrịa a, ịsacha nrị maọbụ mkpụrụ osisi tupu ataa ya, isi nrị na mmiri n'ọkụ tupu erie ya. Dọkịnta Okoli gwara BBC Igbo na ọrịa bụ ihe a na-agwọ agwọ site na ịṅụ ọgwụ pụrụịche Beekee na-akpọ 'antibiotics'. O kwukwara na ịṅụ mmiri kwa mgbe kwa mgbe ga-enyere onye bu ọrịa a aka igbake dịka ya bụ ọrịa na-eme ka mmadụ nyụọ oke nsi nke bụ na ọtụtụ mmiri ga-apụ ya n'ahụ. Na nchịkọta o kwuru na mmiri ọgwụ Beekee na-akpọ 'Oral Rehydration Solution' bụ ọ pụrụịche na inyere ndị bu ọrịa a aka. 'Oral Rehydration Solution' bụ mmiri, Sụga na nri." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59415412 +entertainment Physically Challenged Artist: 'Ihe mere m jiri akụziri ụmụaka ise ihe' Ọtụtụ mmadu na-eche na onye nwere ọrụsị anaghị emenwu ụfọdụ ihe mana Nsoedo Peter na-egosi na nke ahu abụghị eziokwu. Ntoroọbịa a dị afọ 27 na-ese ihe ma na akụziri ndị mmadụ etu e si ese ihe. Maazị Peters nwetere ọlụsị site n'ọgwụ nne ya ṅụrụ oge ọ dị ime. O sị na o bụ nne ya mere ka ọ kwụsị iche uche maka etu ndị mmadụ si ahụ ya. Ndị mere ihe onyonyo a: Chiemela Peter na Ikechukwu Kalu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52270422 +business Coronavirus tips: Lee nka asatọ i nwere ike ịmụta iji nweta ego n'ụwa Coronavirụs a Gọọmenti steeti ụfọdụ dịka Rivas,Kogi agbachiela ọpụpụ na mbata na steeti ha, ebe ụfọdụ dịka Legos mechiri ahịa. Enugwu,Anambara Ebonyi,Imo mechiri ụlọakwụkwọ, ma kwụsịkwa ndị ọrụ oyibo ọrụ dịka ọrịa coronavirus jiderela mmadụ 56 na Naijiria. Ụfọdụ ndị mmadụ tụrụ onwe ha mkpọrọ iji gbalahụ ọrịa a maọbụ kesaa ya ndị ọzọ. Mana ọkụkọ hapụ kwọm, gịnịka ọ ga-eji zụọ ụmụ ya? Onye ọbụla hapụ ịgba mbọ, kedụ ebe opi ga-esi apụtara onye nọ n'ụlọ? Olileanya dị. I nwere ike ị nọ n'ụlọ gị na-amị ego site na ime ihe doro anya ma sikwa ezi. Leekwa ihe ndị i nwere ike ime ugbua iji were na-egbu ego mma n'ụwa Coronavirus a chị ọkụ na amụma ugbua: Onye ọnụ ụtọ, ama m na ịta achịcha na-amasị gị nke ọma mana ị ma na ịmụta etu e si eme ya nwere ike ime gị ite ego ugbua ọgbọ ọgụ siri ike? Ebe ịmụta ime 'meatpie' ji dị mma bụ na i nwere ike ire na ịntanet. 2.Ka e si eme 'hand sanitizer' Mmanu a na-ete n'aka maka mgbochi ọrịa nke a na-akpọ 'handsanitizer na Bekee bụzịkwa 'American visa' ugbua. Otu ekpem 'hand sanitizer' a na-erebu N500 na-adazi N1000 kemgbe ikuku coronavirus kubatara Naijiria. Ọ bụrụ na ịmụta etu e si eme 'hand sanitizer', ọ bụghị naani na ị gaghị na-emefuzi ego, ịzụ ya maka nchekwa gị na-ezianụlọ gị, ị ga-eresi ndị agbataobi gị na ndị ọzọ nọrọ gị nso. Ndị ọkachamara na-eti mkpu maka ọtụtụ kemikal na-emerụ mmadụ ahụ na-adị n'ude ndị ana ere na-ahịa ugbua. I nwere ike ịmụ ka e si eme ude bekee nke iji aka gị zụrụ ngwa e ji eme ya maọbụ ude akị . Udeakị nwere mkpa ahụike dị iche iche ọ na-egbo n'ụmụaka nakwa ndị okenye. I nwere ike isị na anaghị agazị ụka maọbụ agbamakwụkwọ ugbua, mana iwere ugbua ị nọ n'ụlọ mụta etu e si asụ ịchafụ nke ndị Yoroba na-akpọ 'gele', ị mara n' ị naferela. Ịkwụ n'ihu ugegbe awa kwulu awa tupu ị gaa mmemme ebeela. Ị ga-ana esikwa na ya enweta nchọnchọ ego, wezuga anya n'ụgwọọnwa gị. I nwere ike iji oge ezumike mụta etu esi eme ncha nkọta(black soap) e ji asa ahụ. Ugbua ọtụtụ mmadụ naa-alaghachi na ihe ndị dị ka chi si kee ha'organic products' bụ oge ị ga-eji ya kpaa ego. Ị mụta eti e si abacha mmiri n'oge oke agụụ a na-eche ga-eso 'lockdown', okwu agwụla. Ị ga-anọ n'ofe. Ịtaghị ya na akị Bekee, ịgwọ ya agwọ maọbụ iresi ndị mmadụ, ụwa ana aga. 7.Etu e si eji ịntanet akpata ego I nwere ike ịmụta etu e si na-ede 'blog' banyere ihe ị bụ ọkaibe na ya; etu ire ahịa n' ịntanet, ime websait, mgbasaozi ahịa n'ịntanet 8.Etu esi eme achichia bekee(cake) Ugbua a nọ n'agbọ 'Information technology', o nweghị ihe ị nweghị ike ịmụta gụnyere ịmụta asụsụ ọhụrụ. Ihe o ji kacha mma ugbua bụ na ọ dịghị mkpa na ị ga-agara ya ụlọakwụkwọ. Naanị chọọ ụzọ ya n'ịntanet. Ị mụta asụsụ dịka Frenchị, Mandarin wdg ga-abara gị uru n'ihi na i nwere ike ịghọ onye nkuzi asụsụ ahụ ma ji ya akpata ego ma ị mụta ya nke ọma. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52050154 +entertainment Ọ bụghị eziokwu na ụmụnwaanyị na-etinye m na mkpaabụ ha - Tony Umez "Onye aka ochie n’ọrụ ime ejije Nollywood bụ Tony Umez akọwarala BBC Igbo ebe o zoro onwe ya kemgbe dịka ọtụtụ na-ajụ maka ya. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nso nso a, ọ kọwara na enweghị ebe o zoro onwe ya maka na oge na-eruru onye ọbụla mgbe ha na-eji nọpụ iche ma zuo ike nwa mgbe nta. Ọ gara n’ihu kọwaa na ọ meela ọtụtụ ihe ejije ọhụrụ nke gbarala n’ọha ebe ndị ọzọ ga-apụta n’oge na-adịghị anya. Umez onye ọtụtụ ji ama njakịrị maka etu ụmụnwaanyị na-esi akpanye ya n’abụ n’ihe ejije ndị ọ na-eme kọwara na ọ bụghịkwa etu ahụ ka ọ dị maka na ihe ndị ahụ bụ agwa ọ na-akpa  naanị n’ejije. O kwuru na nne ya zụrụ ya ka ọ na-akwanyere ụmụnwaanyị ezi ugwu nke mere ya na nwunye ya nakwa ụmụ ya nwaanyị anọ ji ebi n'udo. Umez gara n’ihu kọwaa etu o siri banye n'ọrụ ime ejije, ihe ndị ọ mụtarala n’ọrụ ahụ nakwa ihe ndị cheere ya na ndị ogbo ya aka mgba. Otu n’ime ihe o kwupụtara bụ ọgbatauhie n’ọrụ ha bụ ọchịchị Naịjirịa dịka ọ kwuru na ọchịchị Naịjirịa nọ n’ọnọdụ ọjọọ ugbua. Ọ gara n’ihu rịọ ọha ka ha pụta tụọ vootu na ntuliaka na-abịa abịa dịka o kwupụtara nkwado ya nye Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n’aha Labour Pati. O kwuru ""Peter Obi abụghị onye amansị mana amaara m na ọ ga-edozi Naịjirịa"" Umez kwukwara na otu n’ime ihe ndị na-atụ ya n’anya bụ etu ndị mmadụ si ekesa akụkọ ụgha banyere ndị a ma ama nke gụnyere onwe ya nke ụfọdụ kwuru na ọ nwụrụ na nso nso a. Kirie ihe onyonyo nọ n’elu akụkọ a ka ị nụrụ ihe ndị o kwuru n’uju. Ndị mere akụkọ a bụ Makuochi Okafor, Chioma Nkemdilim na Vining Ogu." https://www.bbc.com/igbo/articles/cz40w5elyp4o +sports Super Eagles Squad: Ị ma ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles niile? Ndị otu egwuregwu bọọlụ Super Eagles na-eme ụmụ Naijiria niile obioma n'asọmpi iko mba Afrịka nke afọ a. Ha agafeela na agba abụọ nke ikpeazụ na ya bụ asọmpi ebe ha ga-ezute mba Ivory Coast maọbụ Algeria ụbọchị ụka, abali iri na anọ nke ọnwa Julaị. Ị ma mmadụ ole so n'otu ndị Super Eagles? Ị ma aha ha na ebe ha na-agba bọọlụ? Lee ya ebe a: Akụkọ ga-amasị gi: https://www.bbc.com/igbo/afirika-48949444 +health Kedụ ihe ị ma maka ọrịa a kpọrọ 'Monkey Pox'? "Dịka enyochapụtara nje ""Monkey Pox"" n'ime ahụ otu onye Naijiria gara njem na mpaghara Texas nọ na mba Amerịka, dọkịnta Chikwe Ihekweazu bụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa Bekee Nigerian Centre for Disease Control (NCDC) kwuru n'ụbọchị Tozde na enyochapụtala ọrịa n'ezi a n'ahu mmadụ iri na ise na Naijiria ugbua. Ozi ya kwukwara na ha na-enyocha mmadụ iri ise na itolu ọzọ a na-eche nwere ike ibu ya bụ ọrịa. Mba Amerịka n'onwe ha ebidola ịchọ ihe karịrị mmadụ narị abụọ ndị ha si na ha na onye butere ọrịa monkeypox nwere mmekọ. Ọ gịnị bụ ọrịa 'Monkey Pox'? Ọrịa a bụ ọrịa nje nke yiri orịa ""Small Pox"". Nke na-ebute ọkọ yiri ọkọ kịtịkpa n'elu ahụ mmadụ. E nyochapụtara ọrịa a na mbụ n'ime ahụ enwe abụọ ndị okachamara sayensị nwuchiri n'ime ọhịa iji mee nnyocha na afọ 1958. N'afọ 1970, e nyochapụtara ọrịa a n'ime ahụ mmadu na mba Congo. Kemgbe afọ 1970, achọpụtala mmadu ole ma ole bu ọrịa n'obodo ole ma ole nọ n'Afirika nke gụnyere Naijirịa. Njirimara na mgba ama ọrịa 'Monkey Pox' Ọrịa a nwere ike igosi njirimara dị iche iche n'ahụ mmadụ, mgba ama ọrịa a kachasi apụta ihe n'ahụ onye bu ọrịa bụ: Mgbe mmadụ butere ọrịa a ruo ụbọchị atọ, ọkọ ahụ n'ebido fesawa n'elụ ahụ bido n'ihu ya ma fesawa ahụ ya niile, nke a n'eso oke ahụ ọkụ Dịka ọrịa a bụ ọrịa na-efe efe, mmadụ na anụmanụ maọbụ onye bu ọrịa a mekụta ahụ onye ahụ nwere ike ibute ya bụ ọrịa. ""Monkey Pox"" na-efesasikwa ma mmadụ metụ aka n'elụ ebe nje ọrịa nọ dịka elu tebulu, elu akwa, aka ọnụ ụzọ nakwa ebe ndị ọzọ. Nje a na-abanye n'ime ahụ mmadu site n'ebe mmadụ mereru ahụ, maọbụ site na ikụ ụme, maọbụ site na mmadụ imetu aka ọ kwọghị akwọ n'anya, n'imi maọbụ n'ọnụ. Ọrịa a nwekwara ike isi n'ime ahụ anụmanụ banye n'ahụ mmadụ ma ya bụ anụmanụ taa mmadụ maọbụ gọọ ya mbọ. Amabeghi anụmanụ na-ebughari ọrịa kachasia mana nnyocha na-egosi na oke nwere ike bụ anụmanụ kachasi ebu nakwa na-efesa ọrịa a. Ndị ụlọọrụ sayensị nakwa ndị ụlọọrụ ahụike ekwuola na ha achọpụtabeghi ọgwụgwọ ọrịa a, mana a na-eji ọgwụ mgbochi ""Small Pox"" ebelata ike ọrịa a n'ahụ mmadụ. Ọrịa a anaghi egbu egbu nke ukwu mana ọ ka mma mmadụ ichekwa ọnwe ya ma zere ya bụ ọrịa site n'usoro ndị ụlọ ọrụ ahụike depụtara." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57927913 +politics Election Tribunal: Ndị n'ọchị ndị n'akwa Dịka ụlọikpe ntuliaka kpokobachara ikpe maka ntuliaka e mere na mbido afọ 2019, lee ka ihe siri kwuru n'ikpe ụfọdụ a kapigoro ọnụ. N'Enugwu steeti, ụlọikpe ntuliaka nke Jọstis H.H Kereng nọ n'isi ya eweliela aka Ike Ekweremadu nke PDP dịka onye meriri ntụliaka nke Enugwu West nke ya na Juliet Ibekaku nke APC dọrọ. Ndị okaiwu anọ kpere ya bụ ikpe sị na Ibekaku achitaghị aja na ya bụ ikpe. N'otu aka ahụ, Jọstis Sunday Olorundahunsi anọrọla n'Ọka, Anambra steeti kpebie na Victor Ume nke APGA achitaghị aja na ntuliaka ya na Uche Ekwunife mere na ọnwa nke abụọ nke 2019 gbasara oche nke Anambra Centralu. Otu ahụkwa ka ụlọikpe sị welie aka Ifeanyi Uba dịka onye meriri ntuliaka nke ya na Chris Uba n'oche nke Anambra Saụt ha zọrọ. Ụlọikpe ntuliaka nke Jọstis A.O. Chijoke nọ n'isi ya kpebiri na aga atụgharị ntuliaka emere na Kogi West nke Dino Melaye meriburu. N'Ebonyi steeti, ụlọikpe ntuliaka nke Jọsitis Sika Henry nọ n'isi ya sị na ọ bụzị Chinedu Ogah nke APC meriri ntuliaka e mere n'Ezza South/Ikwo constituency n'ọnwa nke abụọ nke afọ a. Ụlọikpe ahụ gwara Inec ka ha nwere ọsọ nwere iji napụta Laz Ogbee nke PDP asambodo mmeri nke ha nyere ya na mbụ ma ye ha Ogah bụ onye ha sị ọ bụ ya ji votu 36,238 merie. Dino etinyelarị akwụkwọ maka ikpegharị ya bụ ikpe ị sị na ya ekwetaghị ihe ya bụ ụlọikpe kwuru. Na Sokoto steeti, ụlọikpe ntuliaka ekpebiela na a ga-emegharị ntuliaka e mere na steeti ahụ makana emecheghị ntuliaka e mere na ọgbọnta votu isii nke Sokoto Nọt ii ụlọ nọchiteanya nke steeti ahụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-49645028 +sports AFCON U20: Otu bọọlụ mba Naịjirịa emeriela nke Nijey Akụkọ dị mkpa taa Otu bọọlụ Naịjirịa nke ndị erughị afọ 20 etozuola ịga asọmpị Iko Mba Afrịka dịka ha ji otu ọkpụ goolu merie mba Nijiey mgbe ha zutere onwe ha taa. Na ndọrọndọrọ, Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec adọọtịala ohere ha nyere ndị mmadụ ịji nata PVC ha site n'ụbọchị Fraide ruo ụbọchị Monde Ọ gụnyere ụbọchị satọde nakwa ụbọchị ụka site n'elekere itoolu nke ụtụtụ rue elekere isii nke mgbede kwa ụbọchị. Ebe otu Citizen Forum, nke onye na-ede akwụkwọ ama ama bụ Wole Soyinka kpokọbara adọnyerela Kingsley Moghalu nke otu YPP ukwu maka ọkwa onyeisiala na 2019. Joe Igbokwe nke APC na Ugochukwu Ikeakor nke PDP akpọọla Ndigbo oku ka ha pụta tụọ vootu ụbọchị ntuliaka iji kwado mwulite Alaigbo. Ha kporo okwu a na mkparịtaụka ha na BBC Igbo nwere na Facebook n'ubọchị Fraide. N'egwurewgu, Ụwa niile, ọ kachasị ndị egwuregwu bọọlụ na-amasị pụtara ịgosi obi ntiwa ha dịka achọtara ozu Emiliano Sala bụ onye ọgba bọọlụ mba Ajentina nọ n'ime ụgboelu dara mmiri na mgbede tọọzde. Akụkọ BBC Igbo n'ime otu nkeji N'ụtụtụ, A zọgburu ihe ruru mmadụ abụọ ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ọgbọ egwuregwu Jolly Nyame n'ọsọ achụmnta vootu APC mere na Jalingo Taraba Steeti. Onyeisiala Buhari kwuru na ọ na-ewute ya nke ukwuu ma ndị hụrụ ya n'anya tufuo ndụ ha n'ihi ịkwado ya. Obi ụtọ juru ụmụakwụkwọ mahadum afọ dịka otu jikọtara ndị nkuzi ha bụ ASUU akwụsịla abụbọ ọrụ ha bidoro kemgbe ọnwa atọ. Nkwụsị a bịara na ngwụcha nzukọ ndị isi ha na minista na-ahu maka ọrụ bụ Chris Ngige nwere n'Abuja. Ebe onyeisi ndị ASUU bụ Abiodun Ogunyemi sị ka ndị nkuzi bido ọrụ ozugbo. Onye kachasị enwe ego n'ụwa bụ Jeff Bezos kwuru na ụlo ntaakụkọ National Enquirer yiri ya egwu na ha ga-agba ihe o jiri bụrụ nwoke n'anwụ ma ọ gwaghị ọha okwu masiri ha. Ọ kwuru na Enquirer sị ya kwuo na ọbụghị ndọrọndọrọ mere ha ji ebu akụkọ gbasara ya n'akwụkwọ mgbasa ọzi ha. Achọpụtala na ozu ahụ ahụrụ n'ime ụgbọelu ahụ kpọkasiri akpọkasị bụ nke onye otu egwuregwu Cardiff City bụ Emiliano Sala. Cheta na Sala mere njem na-aga Cardiff mgbe ụgbọelu ọ nọ na ya nke onye na-akwọ ya bụ David Ibbotson dabara na mmiri. https://www.bbc.com/igbo/afirika-47158519 +entertainment Charly Boy: Ọ bụghị alụkwaghịm kama ọ bụ inwogharị ịhụnanya anyị "Charly Boy kwuru na ọ bụ inwogharị ịhụnanya dị n'etiti ya na nwunye ya bụ Diane ""Lady D"", ka ọ chọrọ ime na ọ bụghị ịgba alụkwaghịm. Charly Boy kwuru nke a mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ya n'ekwentị ịjụ ihe mere o ji dee na soshial midia na ọ chọrọ ịgba nwunye ya alụkwaghịm ma lụgharịa nwaanyị ọzọ. N'elu soshal midia, o dere na ọ na-agba nwunye ya alụkwaghịm makana ""ha abụọ ahụchaala onwe ha, na oge eruola maka ihe ọhụrụ"". Ka BBC Igbo jụrụ ya ajụjụ a, o were olu ọchị sị ""ehenụ! Anaghị m alụzị makana anọọla m ebe ahụ afọ iri anọ, anyị asị ka anyị ""chenjikwaanụ gear"". ""Mana mmadụ ole ghọtakwaranụ na ọ bụ otu onye ahụ ka m na-aga ịlụ? ""Ị ga-agba alụkwaghịm n'otu ụbọchị ma lụọ nwaanyị ọzọ n'echi ya? Enwerenu etu ọ dị. M na nwunye m na-alaghachị n'ụlọọụka inwogharị mkpebi ịhụnanya anyị kpebiri afọ ole gara aga."" O kwuru na onweghi mgbe ọ chọrọ ịgba alụkwaghịm kama na ndị mmadụ ghọtaghiere ihe o dere n'akara soshal midia. Cheta na Charly Boy na Diane ebiela ihe ruru afọ iri anọ ma nwekwaa ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ gbara ha gburugburu." https://www.bbc.com/igbo/afirika-46570874 +politics Anambra governorship election 2021: Ihe Inec na ndị Anambra nwere ikwu maka ntuliaka na-abịa BBC Igbo gara n’Anambra ebe a na-akwado maka ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti nke afọ 2021 jụọ ndị bi ebe ahụ ka o si aga. Ndị ụlọọrụ Inec na ndị Anambra kwuru na ha adila njikere, ha zipụtakwara ozi olemole dị mkpa maka ntuliaka a. Kirie ihe onyonyo a ka ị nụrụ ihe ndị ha nwere ikwu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-59070515 +business Igbo Entrepreneurs: Ụmụafọ Igbo iri bụ 'entrepreneur' kajara akaja Dịka a na-ekwu na ndị Igbo bụ ndị e ji ịzụ ahịa wee mara, lee ụfọdụ ndị Igbo ma nke ha riri gbasara iji ego achụ ego nakwa ikepụta ọrụ n'ala Naịjirịa. Ịgba mbọ abụghị ihe na-atụ ndị Igbo ụjọ, mana e nwere ndị aha ha ka nke ndị ọzọ ada ụda, na ndị kpatarala akụ na-enye ndị ọzọ ohere ịkpata akụ nke ha. Ndị a bụ ndị bekee na-akpọ 'Industrialists'. 1) Innoson Group - Innocent Ifediaso Chukwuma Chukwuma bụ onyeisi ụlọọrụ Innoson Group. Chukwuma bụ onye Ụmụdim nke dị na Nnewi, Anambara steeti. O bidoro iji aha Innoson Group azụ ahịa n'afọ 1981. Ihe Innoson Group na-emepụta gụnyere: 2) IBETO Group - Cletus M. Ibeto Mazi Cletus Madubugwu Ibeto bụkwa nwaafọ Nnewi nke dị n'Anambara steeti a ma ama dịka oji ego achụ ego. A mụrụ ya n'afọ 1952. O bidoro dịka ọkwọụgbọala na onye na-arụzi ụgbọala. Ibeto gbaara Lawrence Amazu nke nwe 'Chidiebere Transport Company' odibo tupu o bidozie nke ya. Ihe IBETO na-eme gụnyere: 3) Chicason Group - Alexander Chika Okafor Alexander Chika Okafor bụ onyeisi ụloorụ Chicason Group nke dị na Nnewi, Anambra steeti. Ọ bụ onye Ụmụdim, Nnewi, Anambara steeti. Ọ bụ n'afọ 1981 ka o bidoro ịzụ ahịa. Ihe ChicasonGroup na-eme gụnyere: 4) Erisco Foods Limited - Mazi Eric Umeofia Umeofia bụ onyeisi 'Erisco Foods Limited'. Ọ bụ onye Amichi nke dị n'okpuruọchịchị Nnewi Saụt, Anambara steeti. O bidoro ịzụ ahịa akụrụngwa ụgbọala n'afọ 1983 na Sokoto. Umeofia bụ onye ọ na-amasị inyere ndị mmadu aka. Ihe Erisco Foods Limited na-eme Ihe e jiri mara ụlọọrụ Erisco bụ: 5) Coscharis Group - Cosmas Maduka Onyeisi ndị ụloọrụ Coscharis Group bụ Cosmas Maduka bụ nwaaf��� Nnewi nke dị n'Anambara steeti. A mụrụ ya n'afọ 1958 n'obodo Jọs dị na Platu steeti. O bịdoro ịzụ ahịa mgbe ọ dị afọ iri na asaa. Ọ bụ n'afọ 1977 ka o bidoro ụloọrụ Coscharis site n'ire akụrụngwa ụgbọala. Ihe Coscharis Group na-eme 6) Airpeace - Allen Onyema Mazi Allen Onyema bụ ọnye obodo Mbọsị nke Ihiala dị n'Anambara Steeti. A mụrụ ya n'afọ 1964 na Bini dị n'Edo steeti. Ọ bụ onye ọkaiwu tupu ọ malite ụlọọrụ 'Air Peace' n'afọ 2013. Ihe Airpeace na-eme Airpeace bụ ụlọọrụ njem ụgbọelu. 7) Kotec Group of Companies - Chika Emenike A mụrụ Chika Emenike onye bụ onyeisi 'Kotec Group' na 'Tummy Tummy noodles' n'afọ 1969 n'Amanatọ Ụzụakọlị dị n'Uruala, Ideatọ nke Imo steeti. Ọ bụ site n'ire akụrụngwa ọgbatumtum ka o si bido ịzụ ahịa ndị ọzọ. Ihe Kotec na TummyTummy na-eme 8) Loius Carter - Louis Onwugbenu Mazị louis Onwugbenu bụ onyeisi ụlọọrụ Louis Carter bụ nwaafọ Uruagụ Nnewi, Anambara steeti. A mụrụ ya n'afọ 1953. Ihe Louis Carter Group na-eme 9) Orange Group - Mazi Tony Ifeanyichukwu Ezenna Mazi Tony Ifeanyichukwu Ezenna bụ onye Akọkwa nke Ideato, Imo steeti. A mụru ya n'afọ 1957. O bụ n'afọ 1988 ka 'Orange Drugs' bidoro ọrụ. Ihe Orange Group na-eme 10) Emzor Pharmaceuticals - Stella Chinyelu Okoli Stella Okoli bụ onye Nnewi dị n'Anambara steeti. O so na ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'ihe gbasara ahụike na Naịjirịa. A mụrụ ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Julaị nke afọ 1944. Ọ bụ n'afọ 1977 ka ọ malitere Emzor Pharmaceuticals dịka kemist. Ihe Emzor Pharmaceuticals na-emepụta: Ndị a edepụtara ebe a abụghị naanị ndị oji ego achụ ego e nwere n'ala Igbo. E nwekwara ndị ọzọ dịka Leo Stan Ekeh nwere Zinox Kọmputa nakwa Konga.com, dgz. Zitere anyị ndị ọ dị gị ka aha ha e kwesịrị ịdị ebe a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50967438 +entertainment Bobby Brown: Etu ọnwụ sị napụ ya ụmụ ya na nwunye ya Ọnwụ bụ nsogbu ụwa o nweghi onye ga-agbanwenwu mana ọ bịarala oti egwu Bobby Brown ugboro atọ n'ụzọ ọjọọ. N'ụbọchị Wenzde, akụkọ malitere ịfegharị na Bobby Brown jnr bụ diọkpara Bobby Brown nwụrụ na be ya n'obodo Los Angeles. Ndị uweojii na-enyocha ya bụ ọnwụ kwukwara na ha echeghi na o nwere onye aka ya dị n'ọnwa nwa Bobby Brown jnr. Ebe o si kara njọ bụ ụdịrị ọnwụ erughieru abịarala ezinaụlọ Bobby Brown ọrịrị mbụ site n'ọnwụ onye bụbu nwunye ya bụ Whitney Houston nakwa nwa ha bụ Bobbi Kristina. Whitney Houston Bobby Brown lụburu odogwu n'iti egwu bụ Whitney Houston n'afọ 1992. tupu ha agbasaa n'afọ 2007 ha mụtaRA nwa nwaanyị akpọrọ Bobbi Kristina Brown. N'afọ 2012 o wuru ewu n'ụwa niile mgbe achọtara Whitney Houston ebe mmiri gbagburu ya n'ime be ya. Nchọpụta nke e mere gbasara ọnwụ ya gosiri na ọgwụike dị ya n'ime ọbara mgbe nwụrụ. Dịka ụlọ ntaakụkọ si kwuo, News.com Australia Brown kwuru na ọnwụ Whitney wutere ya nke ukwu n'ihi na ọ ọ na-agba mbọ ịkwụsịi ọgwụ ike ma tụgharịa ndụ ya. Boobi Krstina bụ naanị nwa Whitney na Bobby Brown mụrụ n'afọ 1993. Achọtara ya etu e si chọta nne ebe mmiri gbagburu ya n'ime be ya mgbe ọ dị afọ iri abụọ na abụọ. Mpụtara nchọpụta emere gosiri na ọgwụike na mmanya ike dịi n'ime ọbara ya. E buru ya gawa ụlọọgwụ ebe ọ nọ nso n'ọnwụ rue ọnwa ole na ole tupu agbanyụọ igwe na-ekuru ya ume, o were nwụọ n'afọ 2015. Achọtara diọkpara Bobby Brown na be ya dị na Los Angeles na mba Amerịka n'ọnwa Novemba afọ 2020. Ọ dị afọ iri abụọ na asatọ mgbe ọ nwụrụ. Amabeghi ma ọgwụike maọbụ mmanya ike eso na ihe gburu ya mana nyocha na-aga n'ihu dịka ndị uwoejii mba ahụ si kwuo. Bobby Brown na ezinaụlọ ya ndị ọzọ Brown na Kim Ward mụtakwara ụmụ atọ gụnyere diọkpara ya nwụrụ anwụ nakwa La'Princia. Ọ lụkwara onye na-elekọta egwu ya anya bụ Alicia Etheredge n'afọ 2012, ha amụọ ụmụ atọ. Nwa ya nwaanyị bụ La'Princia na diọkpara ya bụ Bobby Brown jnr na-emekọ ọfụma dịka nwanne na nwanne. https://www.bbc.com/igbo/afirika-55012534 +politics Ukpabi Asika biography: Ukpabi Asika: Ochie dike Igbo kwenyere na ịnọ na Naijiria kara Igbo mma karịa Biafra "Ọ bụrụ na ọ dị ndụ taa, o nweghị onye ma ma Ukpabi Anthony Asika gaara adị afọ iri asatọ na ise (1936-2004) a kaara akwụgide na nkwenye o nwere oge a lụrụ Agha Biafra. N'oge agha, Asịka so n'otu onye welitere isi na Naijiria bụ nwa afọ ezoghị onwe ya n'ikwupụta nkwenye o nwere na ọnọdụ Igbo kaara ha mma na Naijiria, karịa ikewapụta mba nke aka ha bụ Biafra. Kedụ ihe ị ma maka ya? Kedụ ihe e jii echeta nwa afọ Onicha, Anambara steeti a? Mgbe ọ dị ndụ, Asika bụ onye nkuzi, onye ọrụ Bekee nakwa onye ndọrọnd���rọ ọchịchị. Kedụ ihe a kacha eji echeta ya taa? Dịka onyeisi (gọvanọ) mpaghara a kpọrọ 'East Central State' n'oge ọchịchị ndị agha; site n'ụbọchị 28 nke ọnwa Ọktoba 1967 ruo Julaị 1975, Asika na-akpoku ndị Ọwụwa Anyanwu ochie ka ha wụsa ngwaọgụ ịchọ Bịafra, bia ka Gọọmentị nyere ha aka. Ọ nọchiri Chukwuemeka Odimegwu Ojukwu dịka gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ mgbe Ojukwu durula ndị Biafra n'agha nnwereonwe ha n'aka Naịjiria. N'oge ọ chịrị, naanị Asika bụ onye Igbo nọ n'ọkwa Gọvanọ na Naịjiria, bụ ihe so mee ka ụfọdụ ndị Igbo kpọọ ya 'sabo' n'ihi na ọ zara oku ọchịchị Yakubu Gowon bụ onyeisiala mgbe ahụ kpọrọ ya n'agbanyeghi na ndị Igbo nọ n'agha. Otu ihe Asika kwenyere na ya mgbe ọ dị ndụ bụ na ""Naịjiria ịdị n'otu bụ maka ọdịmma onye ọbụla"", o kwenyekwara na ịlụ agha adịghị mma, mere ka ọ na-ede akwụkwọ gbasara ịkwụsị ya bụ agha Biafra. N'ihi ihe ndị ọ na-ede, Ọchịagha Gowon rịọrọ Asika bụ onye nkuzi na mahadum Ibadan ka ọ bịa chịwa steeti ndị e kewapụtara na ndị na-achọ nnwereonwe Biafra. Ọ dị naanị afọ iri atọ na otu (31) mgbe ọ malitere ịchị ya bụ 'East Central State'. Ka ọ banyere ọchịchị, o jiri ọkwa ya na-arịọ sị na ịlụ agha abụghị ụzọ ka mma isi enweta ihe a na-achọ. Otu ihe o kwuru anaghị echefu echefu bụ ""...mana anyị ekwesịghị ichefu na ọ bụ ndị mmadụ na-anwụ dịka a na-ese okwu. Bịanụ ugbua ka anyị kwụsị agha a..."" Akụkọ kwuru na ọ bụ ya bulitere okwu ""enweghi onye meriri, enweghi onye meriri"" nke Gowon ji kwuo okwu oge agha Biafra biri. Ọrụ mwulite ala Igbo Asika rụrụ N'ihi ụdịrị nnukwu mmadụ ọ bụ, mgbe ọ nwụrụ ndị isi a hụrụ kwaba okpu gụnyere aka chịburu Naịjiria bụ Olusegun Obasanjo na Yakubu Gowon, LT Gen TY Danjuma, Martin Elechi chịburu Ebonyi steeti, Ọkammụta Pat Utomi, Sinetọ Evan Enwerem, Oriaku Maryam Babangida, Emeka Anyaoku bụbu onyeisi ụlọọrụ Commonwealth, Odeakwụkwọ Eddie Iroh na ndị ọzọ zitere ezinaụlọ ya ozi iti aka n'obi iji kwupute mwute ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58542751 +health Coronavirus: Lee ọtọrọ onye na onye ụdị coronavirus pụtagoro kemgbe 2020 "Ọ na-agbagwoju ọtụtụ ndị mmadụ anya ụdị ọrịa covid-19 ole pụtarala kamgbe ya bụ ọrịa malitere ịkpa mkpamkpa. Mata na nje niile nọ nọ n'ụwa nke gụnyere nje ""SAR-CoV-2"" bụ nje nke na ebute Covid-19 na-agbanwe onwe ha kwa mgbe kwa mgbe. Ọtụtụ mgbe, mgbanwe ndị a anaghị egosi n'ahụ maọbụ n'udị ya bụ nje. Ụfọdụ nwekwara ike igosi site na etu ha sị agbasa, ka o si emesi mmadụ ike n'ahụ, otu ọgwụmgbochi na ọ bụ ọgwụ ndị ọzọ si emetuta ya, akụrụngwa e ji elebe ya anya, nakwa ihe ndị ọzọ. Otu ahụike mba ụwa bụ World Health Orgainisation (WHO) nakwa ndị ọrụ sayensị riri amosu n'ọrụ nchọcha malitere itinye anya na nnyocha gbasara ka nje SARS-CoV 2 si agbasa kemgbe Jenuwari 2020. N'ihi etu ya bụ ọrịa si agbanwe, ndị ọkachamara kere ya ụzọ abụọ: ""Variants of Interest (VOIs)"" na ""Variants of Concern (VOCs)"" na bekee. E mere nke a iji kwalite nnyocha na nlebanya n'ime ya bụ ọrịa. Otu WHO nwere ngalaba na-enyocha akụkọ na ihe niile gbasara ụdị 'coronavirus' abụọ a, ma na-ezipụkwa ozi dị mkpa nye mba dị ịcheịhe banyere mpụtara nnyocha ha. Mba dị ịcheịche nwekwara otu nnyocha nke ha na-adonyere otu nke WHO ukwu. Nnyocha egosila n'ọtụtụ mba na usoro nchekwa ndị a WHO bipụtarala enyela aka na-igbochi mfesa nje coronavirus kemgbe ikpa ike ya malitere. WHO nyekwara gọọmentị dị ịcheịche ikike na ndụmọdụ ihibe otu nchekwa n'aka ọrịa a nke ha ọkachasị ka o si emetụta ndị mba ha n'ụzọ pụrụiche. WHO ehibela usoro ịgụ ọrịa nke usoro nọ n'okpuru ngalaba atọ bụ ""GISAID"", ""Nextstrain"" na ""Pango"". Ndị a bụ ndị otu sayensị na ndị ọkachamara n'ihe gbasara nje. Ha ihibela usoro ịgụ aha nje ọrịa a nke gụnyere: Aha dị mfe ịkpọpụta, aha na-agaghi ebute ịkpọ oke maọbụ nketọ nye ndị ọbụla nakwa ndị bu ọrịa a, aha ga-eso mkpụrụedemede mba Greece dịka ""Alpha"", ""Beta"", ""Gamma"", ""Delta"" wdgz. Kamgbe afọ 2020 enyochapụtara ọrịa Covid-19, otu e hibere maka nnyocha, ịgụ aha, nakwa nhazighari ụdịrị ọrịa a, epibụtala ụdịrị ise na mpakala nke ""Variants of Concern (VOCs)"". Lee aha ha ebe a, mgbe achọpụtara ha nakwa ebe achọpụtara ha. *Mara na ozi maka nhazi ha nakwa ntinye n'otu VOCs maọbụ VOI e dere ebe a dị ire naanị mgbe e zipụtara ozi akụkọ a dịka e kwuru na a na-ahazịgharị ya kwa mgbe kwa mgbe (4, Febụwarị, 2022). Marakwa ka e si ahazinye ụdịrụ nje ọrịa a na otu VOCs: A bịa n'otu nje ọrịa nke VOIs. Lee aha ha ebe a, mgbe achọpụtara ha nakwa ebe achọpụtara ha. *Mara na ozi maka nhazi ha nakwa ntinye n'otu VOCs maọbụ VOI e dere ebe a dị ire naanị ugbua mgbe e zipụtara ozi akụkọ a dịka e kwuru na a na-ahazịgharị ya kwa mgbe kwa mgbe (4, Febụwarị, 2022). Marakwa ka e si ahazinye ụdịrụ nje ọrịa a na otu VOIs:" https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-60249938 +politics Akụkọ kachasi taa: RMAFC ekwuola ka ndị sineti akọwa ego ha Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Taa bụ gud Fraidee ụbọchị a na-echeta ogbugbu Kraistị maka ndị ụka Kraistị. Mmemme Ista asarala ọkụ n'ebe dị icheiche na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjira ebe ụka dị icheiche na-eme mmemme ahụ n'ụdị nke ha. Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọkuola ndị ụka Kraistị niile ka ha kwụsị okwu akpọmasị, mpụ na ajọ ihe ndị ọzọ niile. N'ozi Buhari zigara ndị ụka Christ ụnyaahụ dịka a na-akwado mmemme Ista, o kwuru ka ha ṅomie Kraistị n'agwa ya niile dịka ndị na-eso ya. RMAFC ekwuola na ndị sineti ga-akọwa ebe ego ha si. Otu na-ahụ maka ikesa ego na Naịjiria a na-akpọ Revenue Mobilisation Allocation and Fiscal Commission, RMAFC, n'aha ịchafụ ekwuola na ha amaghị ka ego ndị sinetọ na-eri si ruo nde naịra iri na atọ na ụma. Ha kwuru na ego ndị sineto kwesiri iri kwa ọnwa bụ naanị otu nde. N'egwuregwu Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na mba ụwa bụ Fifa agụpụtụla ndị referii mmadụ isii ga-arụ ọrụ n'asọmpi iko mbaụwa. Ndị referii a, ga-enwe referii mmadụ iri si mpaghara Afrịka ga-abụ osote ha mana onweghị onye Naịjiria banyere ya. Ihe nkiri nke taa Ị bụụla onye isi nkwọcha n'oge erughi eru, lee ihe nwere ike ịkpata ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-43580152 +business Etu m si arụpụta nka site n'ihe nkịtị ndị gbara m gburugburu - Kelly "Kelly Omodamwen bụ onye ntoroọbịa na-eme nka. Ọ sị na nna nna ya so na ndị nka a maama sonyere kpụọ akpụrụakpụ ọla nchara ndị Bini maama bụ Queen Idya Festac bronze head bụkwa ebe o bidoro nwewe mmasị na n'ihe nka. Kelly gosiri BBC Igbo ọrụ ya ndị ọzọ di icheiche ma gosi anyị ka o si arụpụta nka ya. Ọ gwara anyị na ọ na-ahụ nka n'ihe nkịtị. Nke a ka ọ kpọrọ ""up-cycling"". Kelly kọwara na up-cycling bụ iji ihe nkiti rụpụta nka etu ọ dị, kama ị gbanwe ọnọdụ ya. O gosikwara BBC ụdị ihe o ji arụ nka ya. Ya mere o ji wee gaakwa mahadum Auchi Polytechnic ịmụtakwo gbasara ọrụ nka. O nyekwara ụmụntorobịa ka ya okwu ndụmọdụ maka aka ọrụ na etu ha nwereike iji bido mewe ya bụ akaọrụ." https://www.bbc.com/igbo/articles/c4nzn0m3r00o +sports Manchester City vs Manchester United: Man Utd bụ Eze ama n'obodo Manchester Ndị Manchester United egosila na agadị nwaanyị anaghị aka nka na-egwu ọ ma agba dịka ha ji okpu goolu abụo astara otu were merie ndị Manchester City. Nke a bụ mmeri nke mbu ndị otu Manchester United na-enweta na abụghị na 'Old Traford'. Na nkeji nke abụo n'agba nke mbu ka Raheem Sterling mere ka ọ chọro iyija ndị Man Utd mana enweghị ebe ọ gara. Nkeji nke iri abụọ na atọ ka Man Utd nwetara penariti mgbe Bernardo Silva gbaturu Marecus Rashfor na-etiti ọnụ goolu ndị Manchester City. Rashford gbara ya were ziga Ederson Aba ebe bọọlụ gawara Abakaliki. Nke a kpaliri mụọ ndị Man Utd dịka ha bidoro chawa ndị Man City ọkụ. Anthony Martial mezuru ya goollu abụọ mgbe ọ were shọtụ gbakaa netị ndị ManCity na nkeji nke iri abụọ na itolu. Manchester City enweteghị onwe ha tupu agbacha agba nke mbu. Ka agba nke abụọ bidoro, ndị otu a mara onwe ha aka. Kama Nicolás Otamendi ji isi were mepee neti ndị MandUtd na nkeji iri asato na ise. ManchesterCity nwara ike ha ma dịka o siri dị nanị otu ndị ga-abu eze na obodo Manchester - Manchester United. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50690191 +entertainment Nedu Wazobia: Ụjọ agụụ dubara m n'ihe ịkpa ọchị Ihe akpamọchị Nedu Wazobia na-eme pụrụiche n'ihi na ọ gụnyere agburu atọ kachasị na Naịjirịa n'ime ya. Ọ na-eme nke Igbo, nke Yoroba na nke Awụsa. N'ime ihe onyonyo a, ọ kọwara mgbe o bidoro na ihe kara ya obi. Gee ya n'uju ebe a: Ọrụ a si n'aka Jessica Nwankwo https://www.bbc.com/igbo/afirika-48237263 +entertainment Gịnị bụ 'Revenge Porn'? "Ọbịbịa soshal midia emeela ka mgbasa ozi dịwanye ngwa ngwa, mana o mekwaala ka mfesa ihe onyonyo dị aṅaa dị iche iche na-efesa. Nke na-ewu ugbua na mba dị icheiche, tinyekwara Naịjirịa, bụ ikesa ihe onyonyo onye gba ọtọ iji megbute onye ahụ. Ọ bụ nke a ka a na-akpọ ""revenge porn"" na bekee. N'abalị ole na ole gara aga, otu nwaagbọghọ ji akara Twitter ya wee bo otu ụkọchukwu a ma ama ebubo na o dinara ya. Nwaanyị a kesara foto gosiri ọtọ nwoke, ma kwuo na ọ bụ ụkọchukwu ahụ ziteere ya foto ahụ oge ha na-akparịtaụka n'ekwentị. Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ malite ibo nwaada ahụ ebubo na ihe o mere bụ 'revenge porn'. Gọọmentị mba Amerịka kọwara 'revenge porn' dịka: ""ikesa aramara maọbụ ọtọ mmadụ dịka foto maọbụ onyonyo, na-anataghị onye ahụ ikike, iji mee ka ihere mee onye ahụ maọbụ ka onye ahụ nwee nnukwu mwute."" Ọ bụrụgodi na mmadụ ji aka ya zigara onye ọzọ foto ọtọ ya maọbụ nke aramara ya, onye ọzọ ahụ enweghị ikike ikesa foto ahụ. ""Revenge porn"" sokwa n'ụdị mpụ nke bekee na-akpọ ""cyber bullying"" nakwa ""emotional abuse"". Na mba Amerịka, ọnụọgụgụ gosiri na ụdị mpụ a metụtara ihe ruru mmadụ nde iri. Ya mere n'afọ 2013, steeti California tinyere iwu mere ka 'revenge porn' bụrụ nnukwu mpụ. Ọ bụrụ na ha dị mmadụ abụọ maọbụ atọ n'ime onyonyo maọbụ foto aramara, a gaghị ikesa onyonyo ahụ ma ọ bụrụ na a nataghị ha niile ikike ime nke a. Ọ bụrụgodi na otu onye enyeghị ikike, ọ ga-abụ ihe megidere iwu ikesa onyonyo dị otu a. Ọ bụ eziokwu na enweghị iwu machiri 'revenge porn' kpọmkwem na Naịjirịa, mana e nwere iwu ndị yitere ya. Ngalaba 170 nke iwu 'Criminal Code Act' kwuru sị: ""Onye ọbụla kpacha anya zipụ maọbụ chọọ izipu (a) ihe ọbụla nwere ike ikpatara mmadụ mmerụ ahụ, maọbụ... (b) ihe ọbụla na-ata arụ n'anya n'ụdị ihe e dere ede, ihe e sere ese, foto, ihe a kpụrụ akpụ, dịrị gawazie... onye dị otu a ga-aga mkpọrọ otu afọ. Ọzọkwa, ngalaba 24 nke iwu 'Cybercrime Act' e wepụtara n'afọ 2015, megidekwara ikesa onyonyo ọtọ mmadụ. Iwu a kwuru sị: ""Onye ọbụla kpacha anya jiri igwe kọmputa ya ziga ozi jọrọ njọ, ozi aramara mabọbụ ihe ọbụla na-atakasị anya, maọbụ onye ọbụla mere ka e zipụ ozi dị otu a... iji kpasuo mmadụ iwe, tinye mmadụ na nsogbu, gbochiere mmadụ ihe, kparịa mmadụ, merụọ mmadụ ahụ, majaa mmadụ, wetara mmadụ iro na akpọmasị, mebie aha mmadụ...onya ahụ ga-aga mkpọrọ afọ atọ ma a maa ya ikpe, maọbụ ọ kwụọ nha nde naịra asaa (N7million), maobụ ha abụọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61386194 +religion Etu e si tọrọ ụkọchukwu Katọlik n'Anambra steeti "Ụka Katọlik nke Achịdayọsis Ọnịcha ekwupụtala na ndị ntọ tọọrọ otu ụkọchukwu ha aha ya bụ Joseph Igweagu. Ozi a si n'aka Prudentius Aroh, onye ụkọchukwu ji ọkwa 'Chancellor' na mpaghara ahụ. Ọ kọwara na ụkọchukwu Joseph Igweagu gara kaa ụka akwamozu n'obodo Umunachi na mgbede ụbọchị Wenezde, abalị iri na abụọ nke Ọkụtoba, mana oge ọ na-alaghachi n'ụlọ ya ka ndị ekperima ahụ tọọrọ ya. Fada Igweagu bụ onye na-elekọta ụlọụka St Joseph Parish, Abata, Nsugbe. ""Anyị na-arịọ ka onye ọbụla kpesie ekpere ike maka ntọhapụ ya n'aka ndị ntọ a ji ya,"" akwụkwọ ozi ahụ Fada Prudentius Aroh dere kwuru. ""Achịdayọsis Ọnịcha na-agba mbọ niile anyị nwere ike iji hụ na o nweere onwe ya."" Oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Toochukwu Ikenga, o kwuru na ya ga-ezighachitere anyị ozi. Mana Ikenga mechara zite ozi ma kwuo na ndị uweojii anatabeghị mkpesa maka ya bụ akụkọ." https://www.bbc.com/igbo/articles/cx97eprdzzpo +politics Latest on Rochas Okorocha: E higharịala ikpe Okorocha na EFCC Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja ehigharịala ikpe n'akwụkwọ EFCC gbara Rochas Okorocha maka ebubo nrụrụaka ego ruru ijeri Naira abụọ na ụma gaa abalị iri na otu nke ọnwa Nọvemba afọ 2022. Ngalaba gọọmentị na-ebu agha megide nrụrụraka bụ 'Economic and Financial Crime Commision' (EFCC) kpụpụrụ Okorocha n'ụlọikpe n'ụbọchị Monde (Mee 30,2022) maka ebubo 17 metụtara nrụrụaka. Ọkaikpe Jọstịs Inyang Ekwo nọ n'isi ikpe ahụ nyere Okorocha onye bụbu gọvanọ Imo steeti ikike isi n'ụlọ na-abịa azara ọnụn'ọnụ ego dị nde narị naịra ise ma ma kwuo ka o deda akwụkwọ njirimara ya nke e ji eje mba n'aka ụlọikpe. Ọkaiwu Rochas Okorocha gwara ndị ntaakụkọ na ha na-agba mbọ ịhụ na Okorocha mezuru ọnọdụ ụlọikpe nyere ha ozigbo iji nye ohere ka Okorocha nwere ohere ịga nnyocha ndị chọọ ịzọọkwa onyeisiala nke pati APC na-eme taa. Ụlọikpe Ukwu dị na-apụja enyela Senetọ Okorochaikike isi ụlọ na-abịa n'ikpe imefu ego dị N2.9bn. Ọkaikpe na-ekpe ya bụ ihe bụ Jọstịs Inyang Ekwo onye higharịrị ikpe ahụ bịa taa bụ Mee 31,2022, nyere mkpebi ka a hapụ ka o si n'ụlọ na-abịa mana o dowe ego dị nde narị Naira 500 nakwa ụlọ ego ya ruru otu ọnụahịa ahụ. Ọ ga-akpọtakwa onye akaebe na ọ gaghị agba ọsọ bụ onye nwekwara ụlọ ọnụahịa ya ruru nde naira 500. Ụlọikpe ahụ gwakwara ya ka o dowe akwụkwọ njirimara e ji aga mba ofesi n'aka kọtụma. Ọkaikpe nyekwara ntuziaka ka e jichie ya n'nga ndị EFCC were ruo oge ọ ga-emezu ọnọdụ isi n'ụlọ na-abịa ikpe nke ụlọikpe nyere ya. Mana ọkaiwu EFCC bụ Gbolahan Latona, jụrụ sị na Okorocha ga-agba ọsọ dịka o meburu na mbụ bụ ebe ha sị na ọ jụụ ịza oku a kpọrọ ya. Ọkaiwu Okorocha bụ Okey Amaechi SAN, gbaghara nke a sị na ọ bụ ikike dịrị onye nke Okorocha nwere ịrịọ ka e nye ya ohere isi n'ụlọ abịa ikpe. O kwuru na ọ bụghị eziokwu na Okorocha gbara ọsọ kama na enyeghị ya akwụkwọ ịza oku a kpọrọ ụlọikpe. Rochas awụchiela n'Ụlọikpe maka ikpe imefu ego dị N2.9bn Rochas Okorocha awuchiela n'ụlọikpe maka ikpe metụtara imefu ijeri Naira 2.9bn. Ngalaba gọọmentị na-ebu agha megide nrụrụraka bụ 'Economic and Financial Crime Commision' (EFCC) kpụpụrụ Okorocha n'ụlọikpe n'ụbọchị Monde (Mee 30,2022) maka ebubo 17 metụtara nrụrụaka. Okorocha, onye na-anọchite Imo -West n'ụlọomeiwu Ukwu Naijiria wuchiri n'ụlọikpe ka ọ fọrọ nkeji 23 ka ọ kụọ Elekere Itoolu (8:37am) n'etiti ndị ọrụ EFCC. Ndị ezinaụlọ ya na ndị na-akwado ya anọrọla n'ụlọikpe oge ahụ. Taa ka ọkaike nọ n'isi ikpe ahụ bụ Jọstis Inyang Ekwo ka anụ arịrịọ ma a ga enye Okorocha ohere isi ụlọ abịa ya bụ ikpe maka ịzara ọnụ ya n'ebubo nrụrụaka nke Bekee kpọrọ 'bail'. N'ebe Elekere 9:07 a kụpụrụ Okorocha n'ụlọikpe, a maghị ihe kpatara nke a. Mana ọ lọghachiri, were oche n'ebe Elekere 9:18. Ụlọikpe juru kpụmkpụm dịka ụfọdụ kwụ ọtọ n'ihi na oche eruteghị ha. Ọkaikpe na-ekpe ya bụ ikpe nbụ Jọstis Inyang Ekwo wụchiri ụlọikpe n'Elekere 9:35, ikpe malitere ozigbo. Ngwa ngwa ọ batara, e nyere iwu ka ndị nile kwụ ọtọ pụọ. Akụkọ ka na-abịa https://www.bbc.com/igbo/afirika-61638485 +politics Gọọmentị etiti akatọọla JOHESU maka mfanyeaka n'ụkwụ Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Gọọmentị etiti akatọọla akwụkwọ ozi otu na-ahụ maka ndị nwe obirinajịọcha degara ya maka nfanyeaka n'ụkwụ Mịnịsta ahụike bụ Isaac Adewole kwuru na otu a kwesiri ịkwụsị ike n'ụzọ ime udo na bụghị ịkpa oke. Ndị ụka Katọlik na Naịjirịa emezuola ọkwa ha maara nụ nke ndị Bịshọp ụka ahụ n'izuụka gara aga kwuru na ha ga-eme ngagharị iwe taa na Naịjirịa niile. Ngagharịnke a bụ maka ndị ụka ha egwuru na Benue Steeti. Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na Onyeisiala mba Saụt Korịa bụ Moon jae-in na-akwado enwe mkparịta ụka maka ihe mgbakwoji anya dị n'ụka ha na ndị Nọt Korịa. Cheta na Nọt Korịa kwuru na ha nwereike igbahapụ mkparịta ụka ya na mba Amerịka. Akụkọ kachasị n'abalị a: Ipob chọrọ ịtinye aja na garị Ọhaneze N'egwuregwu Onye nchịkọta otu manchester City n'oge gara aga bụ manuel Pellegrini ewerela ọkwa dịka ichịkọta West Ham United Ndidi, Iheanacho,Omeruo, Eze na ndị ọzọ awụchiela na Akwa Ibom maka njikere asọmpi Iko mba ụwa na ndị ọzọ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa: https://www.bbc.com/igbo/afirika-44217954 +entertainment Nigerian music Concert: Etu ị ga-esi gbanahụ mwakpo na mmemme egwu "Etu ị ga-esi chekwaba onwe gị na mmemme egwu a kpọrọ ""music concert"" na Bekee. Oge mmemme ekeresimesi bụ oge ndị mmmadụ ji apụ apụ ekworị ndụ. Ebe ọ na-akpọtụ akpọtụ ka ụmụntorobịa na-aga oge ekeresimesi a na emume ndị ọzọ. Otu n'ime ebe a bụ nzukọ ebe ndị n'eti egwu na-abịa agụ egwu ha nke ndị Bekee kpọrọ, ""music concert"". Anyị anụla ọtụtụ akụkọ gbasara ka esi awakpo ụmụnwaanyị n'ebe dị etu a. E nwere ike iwakpọ gị bụ nwaanyị n'ụdịrị mmemme a dị ka e si mee nwaanyị a. Ọ gara mmemme Davido mere na nsonso a wee kwuo na a nara ya ekwentị ya ma wakpokwa ya. Lee ụfọdụ azụ ndị ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa tụnyere anyị bụ ka ụmụnwaanyị na-aga ikpori ndụ ga esi were chekwaba onwe ha. Uzoma Anyaora kwuru sị: Onye ị gbara ""pepper spray"" ga-eburugodu ụzọ chọwa etu ọ ga-esi hụ ụzọ tupu ọ kọwa etu ọ ga-esi metụ onye ọzọ aka. Nma Olebara kwuru sị: Haruna Mohamed kwuru sị: Ndị okachamara n'ihe gbasara nchekwa kwukwara na ọ dị mkpa na ụmụnwaanyị yichiri onwe ha ọfụma ma ha na-aga mmemme ahụ ma hapụkwa ịṅụ oke mmanya ka ha were mara oge ịhe ọbụla bidoro." https://www.bbc.com/igbo/afirika-46702345 +politics Ihe Uche Mefor kwuru maka nchọta Biafra na 2023 "Onye bụbu osote onyeisi otu Indigenous People of Biafra bụ Uche Mefor ekwuola ka ndị mmadụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ saa anya na mmiri ma ghara ikwe ka onye ọbụla ghọgbuo ha n'ihi okwu ịchọta Biafra. Mefor kwuru nke a n'ozi o zipụrụ site n'akara soshal midia ya n'ụbọchị Satọde, ma kwuo na ""onye ọbụla na-ekwu na a ga-enweta Biafra na 2023 bụ ezigbo onye asị"". Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị na-azọ maka nnwereonwe Biafra na-agwa ndị mmadụ na Biafra ga-abịarịrị na 2023. Ụfọdụ ndị na-ekwu nke gụnyere nwa amadị a na-akpọ Simon Ekpa, onye bi na mba Finland, ma si ebe ahụ na-achịkọta otu ngalaba Ipob na Naịjirịa. ""Ekwubuola m mbụ na Biafra agaghị abịa na 2023, mana achọkwara m ikwu ya ọzọ ugbua,"" Mefor kwuru. ""Onye ọbụla na-ekwu na agaghị enwe ntuliaka na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'ihi Biafra, bụ onye Biafra. ""Anyị esobuola ụzọ dị otu a na mbụ, mana ọ mịtaghịrị anyị mkpụrụ ọbụla, Anyị kwesịrị iji ihe mere mbụ mụta ihe. ""Okwesịghị ka a na-ahụta ndị Biafra dịka ndị na-akwatụ ọchịchị onyekwuo uche ya, nakwa njirimara gọọmentị. ""Onye ọbụla na-agwa gị na ọgbaaghara na aka ike bụ ihe a ga-eji nweta Biafra, wepụ onwe gị n'ebe onye dị otu ahụ nọ. ""Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Biafra bụrụ obodo e ji ama atụ, anyị ga-ebido ugbua na-agbaso usoro iwu na ịkwụba aka ọtọ."" Mefor kwuru na ọ bụ eziokwu na nchekwa onwe bụ ihe iwu kwadoro, ""mana ịga weta ngwaọgụ were ya na-egbu, na-awakpo, ma na-eyi ndị Biafra ibe gị egwu, nke ahụ abụghị ihe a ga-anabata"". Ọ gara n'ihu kọwaa, na tupu okwu nnwereonwe Bifra enwee isi, a ga-enwerịrị mba ọzọ na-akwado ya bụ okwu nnwereonwe, nke a na-akpọ 'Patron state' na bekee. Ọ bụ mba dị otu a ga na-ekwu okwu n'otu United Nations iji nye nkwado ka mba Biafra nọọrọ onwe ya, Metu kọwara. Mana ọ bụrụ na mwakpo, ogbugbu, iyi ndụ egwu ka na-aga n'ihu na mpaghara Biafra dịka ọ dị ugbua, onweghị mkpụrụ ọbụla ọ ga-amịta. Mefor kwukwara na ọ ka mma ka ndị niile na-achọ nnwereonwe Biafra banye ndọrọndọrọ ọchịchị iji si ụzọ ahụbanye ọchịchị ma nwee nkwuwa okwu nke ụwa niile ga-anụ. Ebe a na-akpọ Biafra bụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, ndị kewapụrụ na Naịjirịa n'afọ 1967, nke butere agha a lụrụ ihe ruru ọnwa iri atọ. Naịjirịa meriri ya bụ agha, nke mere ka Biafra nọgide n'ime Naịjirịa. Ọ gafeela afọ 50 kamgbe a lụchara agha Biafra, mana ọtụtụ ndị bi na mpaghara ahụ ka na-achọ ikewapụ na Naịjirịa. Ha na-ebo ebubo na gọọmentị Naịjirịa na-emegbu ha ma na-akpazo ha agwa ịkpaoke n'ụzọ dị icheiche. Mana ka ọ dị ugbua, ọtụtụ mpaghara nọbụ na Biafra n'oge a lụrụ agha, ekwuola na ha chọziri ịnọ na Naịjirịa. Enweela otu dị icheiche pụtara ịzọ maka nnwereonwe Biafra, ha gụnyere 'Movement for the Actualization of the Sovereign State of Biafra' (Massob), 'Biafra Zionist Movement' (BZM), nakwa 'Indigenous People of Biafra (Ipob). Onye hibere Ipob bụ Nnamdi Kanu, ọ bụkwa ya bụ onyeisi otu ahụ, mana gọọmentị Naịjirịa na-ahụta ndị Ipob dịka ndị na-eyi ndụ egwu. Gọọmentị jichikwara Nnamdi Kanu maka ebubo ịkpa nkata ịchutu ọchịchị onye kwuo uche ya. Uche Mefor bụbu osote Nnamdi Kanu, mana o mechara wepụ pnwe ya n'otu Ipob, n'ihi na ọ sị na ọ nabataghị atụmatụ Ipob na-agbaso iji nweta nnwereonwe Biafra. Ka ọ dị ugbua, Mazi Kanu ka nọ na mkpọrọ, ebe gọọmentị na-anwụchikwa onye ọbụla bụ onye Ipob n'ihi na ọ bụ otu iwu na-akwadoghị." https://www.bbc.com/igbo/articles/c725kd774ydo +politics Okezie Ikpeazu: Abia anaghị alaghachị azụ na mmepe Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, aka na-achị Abia steeti bụ Gọvanọ Okezie Ikpeazu ekwuola na ihe di iche dị na ọchịchị ya ma a tulee ebe ya kwudoro steeti ahụ. Ikpeazu gara n'ihu kwuo na mgbe anyị rụchara ọrụ ya ji n’aka,na ọbụladi onye isi ga-ahụ ihe ya rụrụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48682134 +business Ọgba mbọ: Ị ma Erisco? Lee ka N4200 si mụtara ya ụlọ mmepụta tomato kachasị n'Afrịka Eric Umeofia, onye nwe ụlọrụ na-emepụta 'Erisco Bonpet fire extinguisher' bụ akọrọngwa e ji emenyụ ọkụ nakwa ụlọọrụ 'Erisco Foods' ekwuola mkpa ọ dị ka ndị Naịjirịa na-arụpụta nri ha na-eri. Ọ gwara BBC Igbo ka o si were naira puku anọ na narị abụọ(4200) wee bido ahịa n'afọ 1981. Mana kirie ka ịhụzie ogo ọ nọzị ugbua na etu o si arụpụta 'tọmatọ nkpọ' na-ezuru Afịrịka niile. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chioma Obianinwa https://www.bbc.com/igbo/afirika-51018112 +politics "Hope Uzodinma: ""Ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ ịgba ụlọ Gọvanọ Uzodinma ọkụ""- Kọmịshọna mgbasa ozi Imo Steeti" "Kọmịshọna mgbasa ozi nke Imo steeti bụ Declan Emelumba kwuru na ọ bụ ndị omekome ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado chọrọ iwakpo ụlọ gọvanọ kama ndị nchekwa nọ n'ụlọ Gọvanọ hụrụ na ha emeghị ihe ha bu n'obi. Ọ bụ na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere ka o siri kọwaa ebe gọọmentị Imo steeti kwụ. Emelumba kwuru sị, ""Ndị nchekwa ekweghị ha mee ihe ha chọrọ ime kama mmadụ otu naọbụ abụọ nwụrụ"". ""Ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchi na-akwado mkpamkpa a na-eme"" O kwuru na ọ bụ ndị iro ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado na-eme ihe ndị a. Emelumba kọwara na ihe ndi a bu n'obi bụ ka ha gosi ndị mmadụ na ọ bụrụ na ha nwereike ịwakpọ ụlọ gọvanọ Imo steeti na enweghị ebe nwere nchedo kama ha emewụghị ya. Mana ihe a na-eme kwa na steeti ọzọ, nke Imo ọ pụrụ iche? O kwuru kwara sị, "" Ihe na-eme n'Imo steeti di iche na ihe na-eme na steeti ndi ọzọ"". Ọ kọwara na-enwere ndị kwuru na mbụ na ha ga-ebute ọgbaaghara n'Imo steeti. Kedụ maka ozi a gọọmentị ga-ezi ndị Imo steteti ụjọ na-atụ? O kwuru na Gọvanọ nọ ya ma gwa ndị Imo steeti ka ha hapụ ịtụ ụjọ n'ihi na gọọmentị na-agba mbọ ihu na ha jidere ndị omekome a tupu ha eme ihe ha bu n'obi. Etu ndị amaghị ndị ha bụ siri gbaa ụlọ Gọvanọ Imo steeti ọkụ Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii n'Imo steeti bu Godson Orlando Ikeowu ekwuola na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa atọ ka ndị wakporo ụlọ aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodim ma. Maazị Ikeokwu sị na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa ""Civil Defence"" abụọ na otu onye uweojii ka ndị a ji egbe gburu. Otu onye hụrụ oge ihe a mere gwaburu BBC na ndị bịara mwakpo gburu onye nche no n'ụlo ahụ. Onye ahụ sịkwa na ha bụ ndị obodo ahụ ma onye ahu egburu, ọ sịkwa na o nwere mmadụ abụọ ọzọ ndị ahụ gburu dịka ha na-abịa obodo ahụ. Obodo Omuma dị n'okpuru ọchịchị Oru East nke Imo steeti. Gọvanọ Uzodimma n'onwe ya anọghị n'ụlọ ya oge mwakpo a mere dịka ọ gara Abuja izute Onyeisiala Muhammadu Buhari. A na-eche ne ọ bụ maka mwakpo dị iche na-eme na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ mere o jiri gawa njem ahụ. Dịka onye hụrụ ihe a mere siri gwa BBC Igbo na ndị a bịara mwakpo a ji ụgbọala na-ebu aja, Siena, na ụgbọala eji ebu mmadụ. Ọ sịkwa na ya busi taya moto n'elu ụgbọala ha. Ọ sị: ""Anyi nụrụ ka egbe na-ada. Obere oge anyi hu nnukwu anwụrụ. Ka ihe a mechara anyị gazie hụ ka ụlọ na-agba ọkụ."" Dika o siri kọwa, ndị nchekwa ndị ọzọ nọ ebe ahụ gbara ọso. Ihe onyonyo na foto ndị etinyere na soshal midia na-egosi ụlọ nche anwụrụ ọkụ na-awụpụ na ya nakwa ụgbọala na-agba ọkụ dịka ndị mmadụ na-agba mbọ ịgbanyụ ya. N'ihe onyonyo a gosiri onye nọ n'ala n'ihu ụlọ Uzodimma." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56871324 +health World Diabetes Day: Ọrịa shuga nakwa ụzọ ị ga-esi gbalahụ ya "Ngalaba World Health Organisation wepụtara ụbọchị 14 Nọvemba afọ ọbụla dịka ụbọchị ncheta ọrịa shuga n'ụwa a kpọrọ 'World Diabetes Day'. Ha kpọrọ emume nke afọ a ""access to diabetes education"" nke gbadoro ụkwụ n'ikuziri ndị mmabụ ihe banyere ọrịa shuga iji chekwaa onwe ha. Ya mere akụkọ ga-eleba anya n'ihe ọrịa shuga bụ nakwa ụzọ e nwereike iji egbochi ya. Gịnị bụ ọrịa shuga (Diabetes)? Ọrịa shuga bụ nnukwu nsogbu ahụike na-ata nchara n'ahụ nke na-egbu ihe karịrị otu nde mmadụ kwa afọ- o nweghị onye e nweghị ike ịrịa ya. Ihe na-ebute ya bụ ahụ mmadụ enweghị ike igweri shuga dị n'ọbara (glucose). Ọrịa shuga taa nchara n'ahụ, o nwere ike ibute ọrịa obi, mkpọnwụ ahụ, ikpu isi, mmebi akịrị (kidney failure) na ibe ụkwụ onye na-arịa ọrịa ahụ. Nsogbu ọrịa shuga na-aga n'ihu - Dịka WHO siri kwuo, ihe ruru nde mmadụ 422 na-arịa ya n'ụwa niile- nke a bụ mmaaji anọ ndị na-arịa ya n'afọ 40 gara aga. Na agbanyeghị ka o siri jọọ njọ, ọkara ndị na-arịa ya amaghị na ha na-arịa ọrịa shuga. Mana mmadụ Igbanwe ka o si ebi ndụ nwere ike igbochi ọrịa a. Lee etu i nwere ike isi mee ya: Gịnị na-ebute ọrịa shuga? Mgbe anyị riri nri mgbadoume (carbohydrate), ahụ anyị na-egweri ya ka ọghọ shuga. Mmiri ahụ (hormone) nke a kpọrọ insulin na bekee nke a na-emepụta na anyịnya (pancreas) na-enye ahụ iwu ka ọ mịkọrọ shuga maka inye ike. Ọrịa shuga na-abịa ma ọ bụrụ na ahụ anaghị emepụta 'insulin' maọbụ na ọ naghị arụ ọrụ nke nwere ike ime ka shuga dọrọ n'ime ọbara. Kedụ ụdị ọrịa shuga? E nwere ụdị ọrịa shuga dị iche iche. Na nke a kpọrọ 'type 1', anyịnya na-akwụsị imepụta 'insulin', nke na-eme ka shuga gbalite n'ọbara. Ndị ọkachara mara sayensị amaghị ihe na-ebute nke a mana ha kwenyere na o si n'ọbara maọbụ nje na-ebute ọrịa nke na-emebi ọwọ (cell) na-emepụta 'insulin'. Ihe dịka pasent mmadụ iri nwere ọrịa shuga nke 'Type 1'. N'ọrịa shuga nke 'type 2' , anyịnya anaghị emepụta 'insulin' zuru ezu maọbụ nke emepụtara anaghị arụ ọrụ. Nke a na-emekarị na ndị gbaliterela n'afọ, ndị na-eto eto, ndị buru ibu, ndị na-anọkarị na-emegharịghị ahụ, nakwa ndị si mba ndịda Asia na-enwekwa ya. Ụmụnwaanyị dị ime nwekwara ike ịria ọrịa shuga nwaanyị dị ime( gestational diabetes) ma ọ bụrụ na ahụ ha enweghị ike imepụta insulin ga-ezuru ha na nwa ha. Ọtụtụ nchọpụta na-ekwu na ihe dịka pasent 6 rue 16 ụmụnwaanyị dị ime ga-enwe ọrịa shuga. Ọ dị mkpa ka ha lebe anya n'ihe ha na-eri, na-emegharị ahụ iji gbochie ọrịa shuaga type 2. Mmadụ nwekwara ike inwe ọnọdu na akwado ịbanye ọrịa shuga- ọnọdụ shuga dị n'ọbaara igbalite elu nke nwere ike ịdaba n'ọrịa shuga. Kedụ njịrịmara ọrịa shuga? Njirimara ọrịa shuga gụnyere: Dịka ngalaba ahụike mba Birten a kpọrọ British National Health Service, njirimara ọrịa shuga 'type 1' na-esosị onwe ya ọsọ ọsọ n'ụmụaka na ndị na-eto eto. Ndị nke 'type 2 na enyekarị nsogbu bụ ndị karịrị afọ 40 (maọbị ndị sị ndịda Asia ruru afọ 25); ndị ndị mụrụ ha maọbụ nwanne ha nwere ọrịa shuga; ndị buru oke ibu; nakwa ndị sị China, na ndị isiojii. Nke mbụ, gbaara nri na mmanya nwere shuga ọsọ. Kama achịcha ọcha(white bread), na-eri nrị zuru oke. Shuga na nri eghere eghe ezụghị oke inye ezi ihe n'ahụ n'ihi na akwara(fibre) nakwa vitamin dị na ha emebiela. Iji maa atụ: Hapụ achịcha ọcha(white bread),eghere eghe osikapa ọcha, mmanya ọtọbịrịbịrị, ịhe ọṅụṅụ ụtụtụ ( breakfast cereals) nwere shuga. Kama hara nrị nwere akwụkwọ nrị, mkpụrụosisi, agwa na mkpụrụ nrị zuru oke. Ezi nrị ndị ọzọ gụnyere dịka mkpụrụ kashu, ọpapa, nakwa azụ nwere mmanụ omega-3 dịka azụ nwankata, azụ ahụekere (markerel) Ọ dị mkpa irichi nrị anya mana erifele afọ. Mmegharị ahụ dị mkpa na-ewetu shuga dị n'ọbara. National Health System (NHS) na-enye ndụmọdụ ka a na-enwe mmegharịa ahụ dịka ịgasi ije ike, ịrị ụlọelu, na egwuregwu ndị ọzọ awa abụọ na ọkara kwa izuụka." https://www.bbc.com/igbo/afirika-46205054 +sports Real Madrid vs Man City: Manchester City apịala Real Madrid mgbachara ndị mmụọ Manchester City ewerela mgbachara ndị mmụọ pịawaa Real Madrid azụ n'azụ ụlọ ha. Ọkpụ goolu abụọ a satara otu ka Man City ji merie Madrid n'asọmpi Uefa Champions League a gbara n'abalị Wenezde. Otu egwuregwu abụọ enweghị nke nyetere ibe ya goolu n'agba nke mbụ. Mana Madrid bu ụzọ nyete goolu nke si n'aka Isco. Oteghi aka, Gabriel Jesus satara ya, ebe Raheem Sterling gbatara penariti nke Kevin De Bruyne gbakpuru iji nye Man City mmeri. Nke ka njọ bụ na Sergio Ramos natara akwụkwọ ọbara ọbara n'asọmpi a, pụtara na ọ gaghị eso n'egwu mgbe Real Madrid ga-aga be Man City. Otu abụọ a ga-akụkọta mpi ọzọ n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị nke afọ a, mgbe ha ga-ezute n'Etihad. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51651437 +sports Jose Mourinho: Ndị otu egwuregwu na-achụzịm "Akụkọ dị mkpa taa Onye bụbu onye nchịkọta otu Manchester United akọwala na ya enwetala ozi ọrụ ruru atọ mana o nweghi nke ọ nara. Cheta na otu Manchester chụrụ ya n'ọrụ dịka onye ndụ n'ọnwa dizemba afọ gara aga. O kwukwara na ndị egwuregwu bọọlụ nke agba ọhụrụ adịghị ka ndị ogbo nke mgbe ochie. ""Anaghị m a park bus"" ka o kwuru. N'okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Ndị mmadụ ataala onye na-azọ ọkwa onyeisiala bụ Atiku Abubakar ụta ihe o jighi sonye na nrụrịtaụka nke ọkwa onyeisiala emere na mgbede ụbọchị satọde Atiku zọrọ isi onwe ya na-ekwu n'agbanyeghi na ọ bịara n'ọdọ nrụrịtaụka ahụ, o sonyeghi n'ihi na onyeisiala Muhammadu Buhari n'onwe ya abịaghị Ebe Onyeisiala Buhari n'onwe ya na-akọwa na ọ bịaghị na ya bụ nrụrịtaụka maka na ọ bataghị Abuja n'oge dịka o gara ọrụ achụmnta vootu na steeti abụọ ndị ọzọ Sọsọ Oby Ezekwesili, Kingsley Moghalu na Fela Durotoye sonyere na ya bụ nrụrịtaụka. Gụọ ya n'uju ebe a: Buhari: Ihe mere m ejighi sonye na nrụrịtaụka Na mba ofesi Otu ụlọikpe dabere n'akwụkwọ iwu mba Kongo ekwezuola na ọ bụ Felix Tshisekedi meriri ntụlịaka emere n'obodo ahụ n'ọnwa disemba afọ 2018. Nke a pụtara na ha jụrụ mkpesa Martin Faylu na ndị ọzọ zọrọ ya bụ ọkwa mere iji tụgharị mmeri Tshisekedi. Akụkọ niile dị mkpa n'otu nkeji" https://www.bbc.com/igbo/afirika-46937995 +health E nyochapụtala ọrịa 'Monkey Pox' n'Abia Steeti "Gọọmentị Abịa Steeti adọọla ndị bi ebe ahụ aka na ntị ka ha kee nkwụcha ma chekwa onwe ha dịka e nyochapụtara ọrịa Monkeypox na steeti ahụ. Joe Osuji bụ kọmishọna ahụike sị na ebe a ndị a hụrụ ọrịa a gụnyere okpuruọchịchị Aba North, Umuahia South nakwa Ikwuano. Osuji kwuru “Anyị emeela ihe niile anyị kwesịrị ime maka ndị a, ha na-anata ọgwụgwụ ugbua” “Anyị anatala ozi ndị niile ha na ndị a nwerela mmekọrịta na nso nso a” “Ụfọdụ n’ime ndị a ebughị ọrịa a dịka nnyocha si gosi ebe a ka na-eche mpụtara nnyocha ime ahụ ndị ọzọ nke ga-esi Abuja pụta” Cheta na ọrịa a malitere na-efesa n’akụkụ ụwa dị icheiche na nso nso a. Gọọmentị Naịjirịa machiri orure anụ ọhịa nke a na-akpọ ‘Bush meat’ na Bekee dịka otu n’ime ụzọ a ga-esi gbochie mefesa ọrịa ‘Monkey Pox’. Ndị ọrụ ahụike na-ekwu na mmadụ nwereike isi n’ụzọ ịta anụ ọhịa bute ọrịa 'Monkey Pox’. Nke a so ozi na a hụrụ ọrịa a n’ahụ mmadụ isii na Naịjirịa n’ọnwa Juun 2022. N’ọnwa ahụ, nke a mere ya mmadụ 21 a na-ahụ ọrịa a n’ahụ ha na Naịjirịa n’afọ 2022. Gọọmentị Naịjirịa amachiela orure anụ ọhịa nke a na-akpọ ‘Bush meat’ na Bekee dịka otu n’ime ụzọ a ga-esi gbochie mefesa ọrịa ‘Monkey Pox’. Nke a na-abịa dịka a hụrụla ọrịa a n’ahụ mmadụ isii na Naịjirịa n’ọnwa a. Nke a na-eme ya mmadụ 21 a na-ahụ ọrịa a n’ahụ ha na Naịjirịa n’afọ 2022. Ndị ọrụ ahụike na-ekwu na mmadụ nwereike isi n’ụzọ ịta anụ ọhịa bute ọrịa 'Monkey Pox’. Ha kwukwara na mefesa na-esi n’ụzọ a anaghị adịkarị ire. Ọrịa Monkey Pox bụ ọrịa nje na-akpata nke ji nwayọ nwayọ mefesa Naịjirịa ugbua. Ọrịa a na-efesakaarị n’ime obodo ebe ọtụtụ ọhịa na-eto. Ọrịa a na-adapụta na ntunye na ntunye na Naịjirịa ugbua kemgbe 2017 mgbe ahụrụ ya na mbụ na nso nso a. Otu ahụike ụwa World Health Organization kọwara na ọrịa a na-aka efesa na ndịda Naịjirịa mana kemgbe 2020, ọrịa a efesala gaa mpaghara etiti, ọwụwa anyanwụ na ugwu Naịjirịa. Otu onye n’ime mmadụ 21 a hụrụla ọrịa a n’ahụ ha anwụọla nke bụ onye ahụ adịghị kemgbe. Ndị ọrụ ahụike na mbido izu a kwuru “Enweghị ihe akaebe gosiri na ọrịa a na-efesa ugbua maọbụ nke gosiri mgbenwe na-etu o si efesa dịka ọ dị n’akwụkwọ nnyocha” Ndị ọrụ Sanyesi na-agba mbọ ịchọpụta ihe na-akpalite mefesa ọrịa a n’akụkụ ụwa dị ịcheịche nke gụnyere Europe, Amerịka na ebe ndị ọzọ. A na-ekwu na mefesa ọhụrụ ndị a esighị n'Afrịka apụta. Achọtala ọrịa monkeypox n'ahụ onye ọzọ na mba Briten, Ka anyị lebanye ọrịa pụrụiche anya. Monkeypox o juru ebe niile? Ọ bụ nje Monkeypox na-ebute ọrịa monkeypox, ya na ọrịa kịtịkpa nwere otu nje na-ebute ha kama monkeypox anaghị enye nsogbu ka kịtịkpa ebe ndị sayensi na-ekwu na anaghị enweta ya kwadaa. Ọ bụ n'ime obodo dị na mpaghara etiti na ọdịda anyanwụ Afrịka, ebe ndị nọ ọhịa nso. Nje a nwere agba abụọ nke bụ 'West African' na 'Central African'. Mmadụ abụo a si Naijirịa bata Briten, ọ dịka ha a na-arịa nke agba West Africa nke echere anaghị enye oke nsogbu kama amatachabeghị nke bụ eziokwu. Onye nke atọ bụ onye ọrụ gbata gbata butere ya n'aka onye na-arịa ọrị a. Kama mmadụ anọ butere ya nsonso a enweghị etu ha na ndị butere ya na mbụ siri nwee mmekọ. UK Health Security Agency (UKHSA) na-ekwu na onye ọbụla chere na obutela ya gaa ahụ onye ọrụ ahụike ma kpọọ ụịloọgwụ tupu ha agawa. Kedụ etu esi ebute ya? Mmadụ nwereike ibute Monkeypox ma ya na onye nwe ya nwee mmekọ. Ọrịa nwereike isite n'ọnya ahụ, ebe esi eku ume, anya, imi maọbụ ọnụ banya ahụ onye ọzọ. Mmadụ nwereike ibute ya site na mmetụ oge mmekọ nwoke na nwaanyị. Anụmanụ dịka enwe, oke na ụsa maọbụ ihe ọbụla nje a metụtara nwereike ịbunye mmadụ ọrịa a. Kedụ etu ọrịa siri dị njọ maka ahụike? Ọtụtu mgbe, ọrịa a anaghị adị njọ ọ na-eji aka ya ala n'ime izuụka olemaole. Monkeypox a nwereike ịkanwanye njọ dịka akụkọ na-ekwu na ogbuola ụfọdụ ndị mmadụ na mpaghhara ọdịda anyanwụ Afrịka. Ugboro ole ka ọ na-etiwapụta? Ọ bụ n'ahụ enweka ebu ụzọ hụ ya, mana kamgbe afọ 1970, anụla maka ya na mba iri dị n'afrịka. Ọ bụ na mba Amerịka n'afọ 2003 ka ahụtara ọrịa na mbụ na mba na-anọghị n'Afrịka. Ọ bụ ndị ha na anụmanụ ndị bu ọrịa nwere mmekọ butere ọrịa a dịka mmadụ 81 butere ya na mba Amerịka. Ọ bụ n'afọ 2017 ka mmadụ 172 butere ya na Naijirịa ebe 75% n'ime ha dị site afọ 21-40. Ọgwụgwọ Monkeypox? Ọrịa a enweghị ọgwụgwọ, kama enwereike ịkwụsị mfesa ya. Ọgwụ mgbochi monkeypox nwereike iji 85% gbochie ya. Obi ekwesịrị ịmapụ anyị? Ndị ọkaibe na-ekwu na orubeghị ọnọdụ ozurumbaọnụ. Prof Jonathan Ball, bụ ọkaibe na molecular virology, nke mhadum Nottingham kwuru sị: "" Ebe ọ bụ naanị otu onye n'ime mmadụ 50 ha na ọrịa nwere mmekọ butere ha na-egosi na ya bụ ọrịa anaghị efesa n'ike"". Dr Nick Phin, bụ osote onyeisi, National Infection Service nke Public Health England (PHE), kwuru sị: "" Ọ dị mkpa ka ndị mmadụ mata na ọrịa mpnkeypox anaghị eji ike efesa n'etiti ndị mmadụ ma etu ọ ga-esi emetụta ahụike ndị ọha ebughị ịbụ"". PHE na ndị ha na onye nwere ọrịa nwere mmekọ na-akparịta ụka iji nye ha ezigbo ndụmọdụ na ihe ndị ọzọ dị mkpa"". Ebe akụkọ a si: PHE England and World Health Organization." https://www.bbc.com/igbo/articles/c8vm35jgq8no +entertainment Sound Sultan: Otiegwu Naịjirịa a ama ama alala mmụọ Olanrewaju Fasasi bụ otiegwu e ji Sound Sultan mara na Naịjirịa alala mmụọ. Akwụkwo na-egfegharị na soshal midia nke bu mbinye aka Dr Kayode Fasasi kwuru na Sound Sultan nwụrụ site ọrịa 'Angioimmunoblastic T-Cell Lymphoma' n'ụbọchị Jụlaị 11, 2021. Kayode depụtakwara na Sound Sultan nwụrụ n'afọ iri anọ na anọ(44). Ọ hapụrụ nwunye ya na ụmụ atọ ya lawa mmụọ. Tuface Idibia ya na Sound Sultan dị n'ezigbo mma depụtara obi mgbawa ya gbasara ọnwụ ezigbo ọyị ya n'elu akara facebook ya ma tinyekwa akwụkwọ ozi ahụ bu mbinye aka Dr Kayode. Nwanne ya nwoke na-etikwa egwu ma na-emekwa ihe nkiri e ji Babadee mara tinyekwara ozi maka ọnwụ Sound Sultan n'elu instagram ya. N'ụbọchị May 12, 2021 ka akụkọ pụtara na ahụ esichaghị ya ike. Sound Sultan tinyere egwu otiegwu Patoranking n'elu instagram ya bụ ozi ikpeazụ tupu enweta akụkọ na ọ lala mmụọ Egwu ahụ na-ekwu ka ndị mmadụ too ya ugbua ọ dị ndụ kama mgbe ọ nwụrụ. Nke a mere ka ndị na-ezite ozi n'okpuru egwu ahụ na-ekwu na ọ dịka ọ ma na ọ ga-anwụ were tinye egwu ahụ. Ihe ndị kwesiri ịma maka otiegwu a kopuru ụwa n'afọ 90s Ndị mmadụ ma Sound Sultan dịka otu n'ime ndị so mee ka egwu chakee na Naịjịrịa. Ọ malitere itiegwu ya n'afọ 1990s. O gosiri mmasị ya n'itiegwu n'afọ 1991 mgbe ọ nọ na ụlọakwụkwọ tupu o bido dewe egwu nke ya. O bidoro mụwa ikpọ ụbọ mgbe ọ gụchara akwụkwọ sekọndiri , n'afọ 1999 o malitere otu egwu nke ya. O na-ekwukarị na ọ bụ nwanne ya nwoke bụ BabaDee nyere ya aka chakee n'itiegwu. N'afọ 2000, ka o tiputere egwu akpọrọ 'Jagbajantis' nke mere ka aha wuwe ebe niile. Sound Sultan arụọla ọrụ dịka onyegwu n'okpuru ụlọọrụ Kennis music n'afọ 1997 nakwa Naija Ninjas site n'afọ 2008 ruo ugbua. https://www.bbc.com/igbo/afirika-57794789 +entertainment Annie Idibia and 2face: Ihe ọhụrụ nwanne Tuface gwara Annie Idibia "Dịka okwu ka na-ebiri ọkụ n'etiti Annie Idibia bụ nwunye otiegwu Tuface nakwa ndị ezinaụlọ ya ihe ọhụrụ apụtala Nwanne Tuface bụ Charly eboola Annie ebubo ọhụrụ ị wakpo Tuface ma kparịa ya n'ihu ndị ọrụ ya na ndị enyi ya. N'ozi o depụtara n'akara Instagram ya na Annie kwara Tuface nir, maa ya karama Hennessy ma na-etikpo ya mkpu mgbe niile. ""Ị gwara ndị orụ gị kpọchie ụzọ zitere gị igodo na Saut Afrịka ebe ị ma na mma m si Abuja bịa ileta ụmụ ya"" ka o gwakwara Annie. Rue ugbua, o nwebeghi ihe Annie zaghachiri ya dịka ọ zaghachiri ya n'ebubo mbụ Charly boro ya. Nwada Annie Idibia bụ nwunye 2face chipụtachara di ya ụkwụ n'ama na soshal midia n'ihi ihe ọ sị na ọ na-agabiga n'ezinaụlọ ha. Kamgbe o mechara nke ahụ ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ ya nke mere aha ji na-ewu ewu. Mana onye ka nwada a bụ? Nke a so n'ihe akụkọ a ga-eleba anya, Ihe I kwesịrị ịma maka Annie Idibia 'Soshal midia abụghị ebe a na-ekpezi okwu di na nwunye' - Nkechi Blessing, Junior Pope Ndị a ma ama etinyela ọnụ n'etu Annie Idibia si buputa esemokwu dị n'etiti ya na di ya bụ Tubaba (2face) na soshal midia. Ndị gụnyere ndị ejije Nollywood a ma dịka Junior Pope, Nkechi Blessing Sunday nakwa Bisi Alimi bụ onye a ma ama maka ikwado mmekọrịta nwoke na nwaanyị, so tinye ọnụ. Nwanne Innocent Idibia '2face' bụ Charles Idibia asaala Annie Idibia n'ihe o kwuru gbasara nwanne ezinaụlọ ha ịmịkọrọ ya. Charles sara okwu Annie kwuru n'ebubo o dere n'Instagram ya, ebe ọ sị na ezinụlọ Tubaba so akpa nkata na-etisa alụmalụ ha. Annie bokwara ha ebubo itinye 'straw' n'ahụ nwanne ha na-amị ya chọọọọ. Charles Idibia dere n'akara Instagram ya na obi adighi 2face mma cha cha mana na ọ nọnyere Annie makana ọ bụ onye okpeudo. Charles gakwara n'ihu bo nne Annie ebubo na ọ na-agwọ ọgwụ. O dere sị: ""I che na ezinụlọ anyị bụ nke ndị iberibe maka na anyị bụ ndị okpe udo. ""Akụkọ Disney a ị buru pụta ugbua bụ ihe mere kemgbe afọ gara aga mana ị na-akọ ya ugbua makana i nwetaghi ihe ị chọrọ. ""Ị chọrọ imetọ aha di gị n'ihu ọha mana ị ma na di gị anaghị achọ okwu n'ihu ọha. Ị chere na nke a bụ ezigbo akụrụngwa ị ga-eji merie na-agha a? E chekwara m na ị ma ihe ka ọ bụ na onye na-eresị gị ọgwụ ike gị enyeghị gị nke dị mma taa? ""Agbakwala ọsọ, bịakwa ka anyị kọwaziere ọha ihe na-eme, ka ha tinyere anyị ọnụ ebe ị chọrọ ịkụwa akị oyibo Nsugbe n'ihu ọha"". Ọ dị ka agwọ abanyela n'akịrịka n'alụmdinanwunye Innocent Idibia a ma dịka 'Tubaba maọbụ 2face' na nwunye ya bụ Annie. Annie Idibia depụtara n'akara Instagram ya n'ụbọchị Tọọzde sị ""Abụ m nwaanyị nwere ndidi, abụghị m onye iberibe. Bido na mbido, onweghị mgbe ezinụlọ gị ji hụ m n'anya. N'agbanyeghi mbọ niile m na-agba mana ọ naghị ezuru ha."" Annie gakwara n'ihu dee, ""Anwaala m ịnọ nwayọ kemgbe, ọ bụghị gị bụ onye mbụ n'ụwa ụmụnwaanyị ndị ọzọ mụrụla ụmụ. I nwere ike ime ọfụma karịa etu a. Ihe niile m na-eme kemgbe bụ igosi ụwa na ị bụ ezigbo mmadụ"" Nwunye 2face gakwara n'ihu kụwaa aki onyibo Nsugbe mgbe o depụtara ""Nke a i mere taa; gị, Efe, Frankie na ndị ezinụlọ unu mere, anabataghi m ya cha cha."" ""Kedụ ụdịrị nwoke na-eduga ụmụ ya ebe egwuregwu Disney ma saa anya duru ụmụaka ahụ gaa lakwuru nne ha na-abụghị nwunye gị n'ụlọ? Ụgbọrọ ọle ka gị na ụmụ gị garala hụkọ Pero ọnụ ma ọ nọnyere gị na ụmụ aka ahụ n'ụlọ. Ihe dị etu a emebuọla mbụ n'afọ 2015 na 2016 ebe ha abụọ bu esemokwu ha pụta sọshal midia. Ihe kpalitere esemokwu ha mgbe ahụ bụ foto pụtara na sọshal midia gosiri ihe dịka ebe 2face na-esusu Pero ọnụ n'afọ 2015. Ihe a na-eme n'etiti 2face na nwunye ya bụ okwu a kpụ n'ọnụ ugbua na soshal midia nke mere ndị mmadụ ji ajụ ""Di na nwunye ekwesịrị iburu esemokwu ha pụta Soshal Midia?"" Cheta na Tubaba na nwunye ya Annie bidoro ime enyi kemgbe afọ 2004 mgbe ha zutere na Even Ezra Music Studio. N'agbanyeghi na ọtụtụ ihe chere ha aka mgba nke gụnyere na Tubaba atụnyebuola ụmụnwaanyị abụọ ime ha amụọrọ ya ụmụ ise, Tubaba gara n'ihu rịọ Annie ọlụlụ n'afọ 2012. Ha abụọ lụrụ n'ụbọchị 23 nke ọnwa Maachị nke 2013. Ha ebiela kemgbe ahụ ruo ugbua. Ya na Annie amụọla ụmụ abụọ (ụmụnwaanyị) kemgbe ahụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58432338 +politics Nnamdi Kanu re-arrest: Onyeisi Ohaneze ekwughị na iju maka Nnamdi Kanu bụ mkparị - Alex Ogbonnia "Ọnya na-ahụ maka mgbasa ozi ndị otu Ohaneze bụ Alex Ogbonnia ekwuola na akụkọ na-efegharị na soshal Midia nke na-ekwu na onyeisi Ohaneze bụ George Obiozor kwuru na ọ bụ mkparị ijụ ohaneze ma ha a ga-etinye aka na nwuchi Nnamdi Kanu abụghị eziokwu. Ogbonnia kwuru sị, ""Ihe a bụ nsogbu sitere na Soshal Midia, ọ nweghị mgbe Obiozor kwuru maọbụ chee uche ikwu ya bụ ihe. Ọ bụ akụkọ asị"". Ọ bụghị nanị Obiozor ka ndị mmadụ na-etinye okwu ọ na-ekwughị n'ọnụ, akụkọ ga-egosi gị ụfọdụ ndị ọzọ - John Okiyi bụ ọnụ na-ekwuchitere Okezie Ikpeazu onye bụ Gọvanọ Abia Steetị ekwuola na akụkọ na-efegharị na soshal Midia nke kwuru na Ikpeazu gwara Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ka ọ tụọ Nnamdi Kanu nga maọbụ kpọhachi ya mba Briten bụ akụkọ ụgha. Okiyi kwuru ka ndị mmadụ hapụ ịge ya bụ akụkọ ma sị na Gọvanọ Ikpeazu ka si njem ọ gara n'ofesi iji kpọbata ndị oji ego achụ ego na steeti ahụ dịka e siri maa n'ọkwa. Okiyi kwuru sị, ""O nweghị mgbe Gọvanọ jiri zaa ajụju ọnụ ọbụla maka ihe gbasara Nnamdi Kanụ"". O kwukwara sị na ha adịla njikere ịkpọpụ ndị bidoro ya bụ akụkọ ụgha ụloikpe dịka ha achọpụtala ndị na-ebu akụkọ ụgha a megide Gọvanọ Abia steet. Akụkọ ụgha ndị ọzo na-efegharị maka nwụchị Nnamdi Kanu Kemgbe Gọọmentị etiti  nwụchigharịrị onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu, akụkọ ụgha metụtara ya na-efegharị dịka aja adị n'ala. BBC Igbo gbaliri ịchọpụta nke bụ eziokwu n'akụkọ ụgha ise wuru ewu n'ime ha. Lee ha: 1. Nke e boro Ohaneze Ndigbo Worldwide Akụkọ na-ekwu na otu Ohaneze NdịIgbo kwuru na nnwuchi gọọmentị nwụchịrị Nnamdi Kanu egbochiela agha ma webata udo n'Ọwụwa Anyanwụ. Mana onye na-ahụ maka mmekọ otu Ohaneze Ndigbo Worldwide na ndị ọha bụ Chiedozie Alex Ogbonnia kwuru na-enwebeghị ihe Ohaneze Ndigbo, maọbụ onyeisi ha bụ George Obiozor, kwuru maka nnwuchi Nnamdi Kanu. Ogbonnia kwuru na akụkọ a na-efegharị bụ asị. Ọ gara n'ihu kwuo na ha anaghị eji ọsịsọ edepụta akwụkwọ ozi. Ha dọkwara ndị na-eme ụdịrị ihe a aka na ntị ma sị na ha mee ya ọzọ, na Ohaneze Ndigbo ga-eji iwu Naijirịa gosi ha ihe ọkụ ji ntị oke eme. 2. Nke e boro Asari Dokubo Ihe onyonyo na-efeharị nke gosiri ebe Asari Dokubo na-akwa Nnamdi Kanu emu ma sị na ọ ga-achọpụta ebe o zoro. Nnyocha gosiri na nke a bụ asị. Ya bụ ihe onyonyo bụ n'afọ 2020 ka ọ mere ya. BBC Igbo kpọtụrụ Asari Dokubo maka nwuchi anwụchịrị Nnamdi Kanu kama o kwuru na onweghị ihe ọ chọrọ ikwu ugbu a. 3. Nke e boro Rochas Okorocha Aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola n'akụkọ na-efegharị nke kwuru na ya katọrọ nnwụchi a nwụchiri Nnamdi Kanu bụ okpotokpo asị. Akwụkwọ mgbasaozi na-efegharịrị na soshal midia ụbọchị Tuzde kwuru na ""Rochas Okorocha akatọọla nnwụchi a nwuchirii Nnamdi Kanu."" Ozi ahụ nke bu aha ọnụ na-ekwuru Okorocha bụ Sam Onwuemeodo kwukwara na ""ọgụ megide otu Ipob maọbụ ESN bụ ọgụ megide ndị Igbo nke Ọchịchị Buhari na-alụ."" Mana Sam Onwuemeodo gwara BBC n'ekwentị sị ""ezipụghị m ụdị akwụkwọ mgbasaozi ahụ."" 4. Nke e boro Malami Akụkọ ụgha ọzọ na-efegharị oge a nwụchịrị Nnamdi Kanu bụ nke eboro Mịnịsta Ikpe ziri ezi na Naijirịa bụ Abubakar Malami dere. Ya bụ akụkọ asị kwuru sị ""Ndị Igbo bụ ndị iberibe. Ọ bụ ha bụ nsogbu Naijirịa. Ndị awụsa ma ha dịka ohu ha bụ. Ha mara na ndị Fulani bụ ndị kachasị"". Kama n'akwụkwọ ozi onye enyemaka Malami pụrụiche bụ Umar Gwandu depụtara, ọ kwuru sị ""Onye ọkaikpe kachasị na Naijirịa na Mịnịsta na-ahụ maka ikpe ziri ezi enweghị mgbe o jiri dee maọbụ chee uche ịde maọbụ wepụta edemede mkparị a maọbụ nwee ebumnobi ịkọtọ agbụrụ ọbụla na Naijirịa"". Ha kwuru na ụlọọrụ okaikpe kachasị na Naijirịa na-agwa ndị Naijirịa ka ha tụrapụ ya bụ akụkọ dịka akụkọ ụgha. 5.Nke eboro Chimamanda Adichie Nwaada Igbo na-ede akwụkwọ a ma ama, bụ Chimamanda Adichie agbaala ama na ozi na-efegharị maka nwụchighari Nnamdi Kanu nke ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ya dere esighị n'aka ya. Kemgbe ụbọchị Monde, ozi nke isiokwu ya bụ 'Ntugharịuche maka nwoke a bụ Nnamdi Kanu' nke e tinyere aha Chimamanda Adichie na ya dịka onye dere ya na-ewu, na-efegharị na ọbaozi Whatsapp nakwa Facebook. Ozi ahụ kwuru na ọ bụ naanị ndị Igbo bụ ndị na-akatọ Nnamdi Kanu bụ nwanne ha, na agbụrụ ndị ọzọ dịka ndị Yoruba anaghị ekwu okwu ọjọọ banyere Obasanjọ, maọbụ kwanu nke ndị Awusa na-ekwu okwu ọjọọ na social midia maka mkpakpa ndị Boko Haram na-akpa. Mana Chimamanda Ngozi Adichie, site n'ozi nke ndị na-ahazi mgbasaozi ya wepụtara ụbọchị Tuzde, kwuru na ozi ahụ esighị n'aka ya kama o si n'aka nwaada Igbo ọzọ na-ede akwụkwọ aha ya bụ Gloria Ogo. N'ozi ha wepụtara n'akara Facebook nwada Adichie, ha sịrị, ""Onye dere ozi ahụ bụ Gloria Ogo mana ndị amakekwu were aha Adichie tinye na ya bụ ozi."" Ha gaara n'ihu tinye akara ebe ndị mmadụ nwere ike inweta ozi ọbụla si n'aka Chimamanda Adichie." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57737999 +entertainment Sinach songs: 'Ụfọdụ anaghị aghọta na aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ' - Sinach "Sinach bụ otiegwu a ma ama nke ezigbo aha ya bụ Osinachi Joseph (na-azabu Kalu) kọwara maka ndụ ya na mkparịtaụka pụrụ iche ya na BBC Igbo nwere. Ọ gwara BBC etu o si malite iti egwu, ọrụ ụkọchukwu Chris Oyakhilome rụrụ na ndụ ya iji mee ka ọ bụrụ onye a ma ama ugbua. Sinach kwukwara etu o si zute di ya n'ụlọụka nakwa etu nwaanyị ọbụla kwesịrị isi na-ekpe ekpere inweta ụdịrị di Chineke nyere ya. N'ihe gbasara etu o si bụrụ onye a na-anụ aha ya n'ụwa ugbua site n'egwu ya nakwa etu ndị na-etolite etolite ga-esinwu dị ka ya, o kwuru sị na ụfọdụ ndị na-ahụ naanị ebube ọ nọ n'ime ya ugbua, na ha anaghị ahụ ahụhụ a tara. O kwuru sị na ""Ụfọdụ anaghị aghọta na aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ"". Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-58713446 +health Coronavirus: 'Lockdown' agbanweeela etu ụwa sị atụgharị okirikiri anyanwụ Ijeri kwuru ijeri mmadụ n'ụwa dum nọ n'ụlọ maka mmachi ngagharị (lockdown) n'ihi ọrịa coronavirus - nke a ebidola ịgbanwe etu ụwa si atụgharị okirikiri anyanwụ. N'ihi mmachi a, njem maka ọrụ maọbụ egwuregwu, n'okporoụzọ maọbụ n'okporo ụgbọoloko belatara, ebe ụlọ mmepụta ngwahịa dị arọ mechiri emechi. N'ezie, ọtụtụ n'ime anyị welatara aka n'ihe anyị na-emebu. Nke a mere ka nnugha ụwa na-enugha belata. Ọ bụ ihe ịtụnanya ịmata n'ụwa anyị a dị arụ karịa tọn tarị ijeri isii (six billion trillion tonnes). Ndị ọkammụta sayensịa na 'Royal Observatory' nke mba Belgium bụ ndị nyopụtara mgbanwe a. Ndị nnyocha chọpụtakwara mgbanwe a n'ebe dị icheiche na gburugburu ụwa. Na Nepal, a hụrụ ya. Otu onye na-arụ ọrụ na 'Paris Institute of Earth Physics' kwuru na mgbadata ntụgharị ụwa ha hụrụ n'isi obodo ahụ kara aka. Otu okwu ahụ ka ndị mere nchọpụta na Cal Tech University dị na mba Amerịka kwuru na ihe ha nyopụtara na Los Angeles gbara ha nnukwu gharịị Ikuku dịzị ọcha karịa, ebe okeosimiri deere jụụ. 'Nitrogen dioxide' si n'ụgbọala na injini na-enye ọkụ ebelatala. Ndị sayentịsti kwukwara na oke mkpọtụ na-eme n'obodo mepere emepe belatara. N'otu aka ahụkwa, ndị na-enyocha okeosimiri kwukwara na mkpatụ osimiri belatara Mgbanwe nile abụghị ihe ọhụrụ. Ndị mmadụ na-akpagharị n'ehihie karịa n'abalị nke mere abalị ji ajụ oyi karịa ehihie. Mbelata ntụgharị ụwa na-emekwa n'oge ezumike na mmemme. Mbelata ntụgharị nke mere n'izuụka na ọnwa olemole gara aga yiri nke a na-ahụ oge Ekeresimesi na mba ndị na-ekpe okpukpere Kraistị. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52317855 +politics Enugu: Ihe gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi kpebiri maka mwakpo ụlọọrụ uweojii na-eme ebe ahụ n'Ọgọstụ 23 Gọvanọ Enugu steeti bụ Ifeanyị Ugwuanyị adọọla aka na ntị ka ndị wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Ogui nakwa Abakpa ma bukọrọ egbe ha, weghachi egbe ndị ahụ. O kwekwara nkwa na ọ ga-eme ihe niile o nwereike iji chọpụta ihe kpatara ọgbaghara dapụtara n'Emene n'Ọgọstụ 23 ma gbochie ya ime ọzọ. O kwuputara nke a na ngwụcha ọgbakọ gbata gbata ya na ndị isi nchekwa nwere na steeti ahụ. Ugwuanyi gosiri mwute ya maka ndị tufuru ndụ ha n'ọgbaghara ahụ mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụlọọrụ gọọmenti ụnyahụ bụ Sepụtemba 1. O kwuru na site na mpụtara ọgbakọ ya na ndị nchekwa mere, na ọ dị mkpa inyetu ndị na-eme nnyocha obere oge ka ha wee mechaa nnyocha ha na-eme. Gọvanọ Ugwuanyi kwukwara na ọgbaghara nke Ọgọstu 23 nke weere ndụ ụfọdụ ndị nchekwa na ndị Enugu nakwa mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii n'Ogui nakwa Abakpa (Ọgọstụ 28 na 30) ebe e buuru ụfọdụ ngwaagha, na-enye ya nchekasị. Ugwuanyi kanyere nzụkọ ya na ndị igwe na ndị ụkọchukwu nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ụbọchị Sepụtemba 3. https://www.bbc.com/igbo/afirika-53985676 +health Cronavirus: Lee mba ndị COVID-19 echetabeghi Ọrịa coronavirus nke a na-akpọ COVID-19 na-eme njem na-agagharị mbaụwa dị icheiche mana ị ma na e nwere ebe ndị ọ tụbeghị ụkwụ ruo ugbua? Ọrịa a batara Naịjiria n'ime izu ole na ole gara aga, egbuola ihe karịrị mmadụ puku 50 kemgbe o selitere isi na mba Chaịna n'ọnwa Jenụwarị 2020. Ka ọ dị ugbua, ihe ruru mmadụ otu nde ebutela ya bụ ọrịa na mbaụwa, ebe ihe karịrị mmadụ puku narị abụọ gbakerela. Mana ị makwa nke ekwe na-akụ nwanne? Ruo taa bụ abalị atọ nke ọnwa Eprelụ, e nwere mba ndị ejibeghi anya hụ kama otu onye bu ọrịa a. Ị na-ajụ mba ndị ọ bụ? Ngwa lee ka anyị kọwaara gị: Dịka BBC si chọpụta na ngụkọ mahadum Johns Hopkins mere, mba 18 n'ime mba 193 so n'otu mbaụwa bụ United Nations enwebeghi otu mkpụrụ onye bu ya bụ ọrịa. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-akọwa na o nwereike ịbụ na mba ndị a akpọpụtabeghi ọnụọgụgụ ndị bu ya; na ọ bụghị na enwebeghi ndị butere ya. Ndị ọzọ, ọkachasị ndị a bụ mba ndị nọ n'elu mmiri a na-akpọ aịlandị, nwereike ha ebutebeghi ya n'ihi na ha anaghị enwekarị ndị si esi abata mba ha (bụ etu ọtụtụ ndị mba ọrịa a na-enye nsogbu ugbua a si bute ya). Ụfọdụ mba ndị ahụ tere ezigbo aka nke bụ na mmadụ ga-eme oke njem tupu o rute ebe ahụ. Ihe dịka mba Nauru, machiri mba Chaịna, Saụt Koriya, Itali na Ịran ịbata na mba ha ka ọrịa a malitere. Ha kwụsịkwara ụfodụ ụgbọelu si mba ndị ọzọ ifetu na mba ha, dịka onyeisiala mba ha sịkwa na o ji ekpere na akwụkwọ nsọ echekwa mba ya. Ndị ọkachamara na-ekwu na mmachi na mgbochi ha na-eme nwereike na-azọ ha ugbua, mana o nwereike ghara ịdịgịde. Maka gịnị? Andy Tatem, bụ ọkammụta sayensị na mahadum Southampton, kwuru na mba ndị a na-atụbatakwa ihe dịka nri na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka. Nke bụ na e gbochigide, oge ga-erukwa mgbe ha ga-achọ ịtụbata nri maọbụ ihe ndị ahụ maọbụ ibupu nke si mba ha. Mgbe ahụ ha ga-emepe okeala ha makwa bulie ụfọdụ mmachi a nke ga-eme ka ọrịa a nwee ohere ịmịbata. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-52158515 +entertainment Tiwa Savage eferela Mavin Records aka, feghara Universal Music "Akụkọ ndị dị mkpa: Otiegwu a ma ama bụ Tiwa Savage ebinyela aka n'akwụkwọ nkwekọrịta nke ya na ụlọọrụ egwu ọka ibe n'ụwa bụ 'Universal Music Group' maka ikesa egwu ya n'ụwa niile. Universal Music Group bụ ụlọọrụ ntipụta egwu so na ọkachamma na mba ụwa nke nwere ndị otiegwu kara aka gụnyere Aaliyah,Elton John,Katy Perry na Lady Gaga dịka ndị egwu ha. Cheta na Tiwa Savage nọrọ na Mavin Record afọ asaa ebe ọ nọ tipụta ọtụtụ egwu wuru ewu dịka ""Lover, lover."" N'ozi ekele nke onyeisi Mavin Records bụ Don Jazzy zipụtara n'igwe Instagram ya, o kerele Tiwa maka ""ịbụ ihe mkpalite mụọ"" nye ha n'ụlọọrụ ha ma kwee nkwa ikwado ya dịka ọ na-aga n'ihu. Eze Thailand alụọla onye nche ya ma chie ya ezenwaanyị Eze Maha Vajiralongkorn nke dị afọ 66, alụọla Generalụ Suthida Vajiralongkorn Na Ayudhya, onye bụ osote onyeisi ndị na-echekwa ya ma mee ya 'Ezenwaanyị Suthida'. Eze Vajiralongkorn onye nwere ụmụ asaa, alụọla nwaanyị ugboro atọ ma gbasa. Eze na nwaanyị ọhụrụ ya a emeela enyị ọtụtụ afọ dịka a na-ahụ ha abụọ n'ọha ọtụtụ afọ mana nke a bụ mbụ a na-akpọ okwu aha banyere mmekọrịta dị n'etiti ha. Suthida na-arụbu n'ụgboelu mba Thai bụ 'Thai Airways' tupu Vajiralongkorn akpọpụta ya mee ya otu na ndị na-eche ya nche n'afọ 2014. O mere ya generalụ n'afọ 2016. Mmadụ anọ bu egbe wakporo ma tọrọ Alhaji Musa Umar bụ eze Daura, obodo onyeisiala Muhammadu Buhari n'abalị Wenezde. Umar , onye e kwuru si n'ụlọụka alakụba ebe ọ gachara kpee ekpere pụta ma nọrọ ọdụ n'ihu ụlọ ya mgbe ndị omekeome wụbatara, gbalie egbe elu iji chụsasịa ndị mmadụ ma kpụrụ nwoke ahụ. Ntọrị ndị mmadụ na-arị ibe ya elu n'ugwu Awusa na nso nso a. Na nso nso a , onyeisi ndị uweojii kwuru na opekatampe, atọrọla mmadụ 685 bido n'ọnwa mbụ n'afọ wee rue n'ọnwa Eprelụ afọ a. Naanị abalị ole na ole, a tọrọ onyeisi ngalaba na-ahụ maka agụmakwụkwọ praimarị nke a kpọrọ 'Universal Basic Education Commission"" bụ Mohammad Mahmood Abubakar na nwa ya nwaanyị abalị atọ. gara aga. Magu amajala ndị gọvanọ n'okwu nchekwa Onyeisi ụlọọrụ EFCC bụ Ibrahim Magu etiwela akị oyibo nsugbe. Ọ sị na ụfọdụ ndị gọvanọ na kwanye ọkụ na nsogbu nchekwa na steetị ha ka gọọmentị etiti were tinyekwuoro ha ego na ego nchekwa a na-enye ha Ndị gọvanọ na afụnye ọkụ na nsogbu nchekwa iji nweta ego-MaguMagu arụala ndị Gọvanọ aka ọjọọ gbasara. Okorocha sị na Inec enweghị ike ịnapụ ya ike Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwusiela ike na Inec enweghị ike ịnapụ ya mmeri o meriri na ntuliaka e mere n'ọnwa maachi. Okorocha kwuru nke a n'akwụkwọ ọ degaara onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu bụ ebe o kwuru na Inec dara iwu site na ijichi asambodo ya. Osote onyeisi Central Bank nke Naịjirịa bụ Joseph Nnanna ekwuola ka obodo dere jụụ na o bụghị eziokwu anisi ga-alọhachị na Naịjirịa. Onyeisi ọgbakọ ndị otu gọvanọ bụ Abdulaziz Yari kwuru na e lewe anya ka ụsụ dowere ọnụ na ọtanisi nwere ike ịlọhachịte n'ala a afọ na-abịa. Ụmụibe n'egwuruegwu, Barcelona etinyela otu ụkwụ n'asọmpi nke ikpeazụ site na mmeri ha jị ọkpụ atọ merie Liverpool ụnyahụ. Goolu abụọ a Messi nyere mere ka goolu ya kụrụ ọnụ na narị isii kpọmkwem n'afọ iri na anọ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48130559 +business Priscilla Ekwueme Eleje: Onye bụ nwaanyị a na-akpa ike? "Priscilla Ekwueme Eleje bụ nwaanyị mbụ mbinyeaka ya na-apụta n'ego Naịjirịa nke otu puku, n'ime afọ iri isii na otu. Ọ bụkwa nwaanyị nke mbụ ga-anọ n'ọkwa ""Director of Currency Operations"" n'ụlọakụ etiti na Naịjirịa. Ihe abụọ ndị a bụ ihe mere o ji ewu ewu ebe niile na Naịjiria gụnyere soshal midia. Ọ bụ onyeisi na-ahụ maka ngagharị ego na Central Bank bụ ụlọakụ etiti Naịjirịa. Priscillia ga-esonye Ngozi Okonjo Iweala na Sandie Okoro bụ ụmụnwaanyị Naịjirịa abụọ nwere ọkwa n'ụlọakụ ukwu nke ụwa niile. Anyị ga-ewetakwa ihe ndị a na-amaghị maka Odoziakụ Priscillia Ekwueme Eleje." https://www.bbc.com/igbo/afirika-47944824 +health Coronavirus Update: Lee ihe ga-agbanwe ma e bido njem site steeti gawa steeti ọzọ "Gọomentị ekwuola etu njem ụgbọala n'etiti steeti ga-esi adị. Ọ bụ na mgbasa ozi nke ngalaba nzụkọ presidemtial Task Force kwuru na-ewepụla mmachi njem site otu steeti gawa ọzọ. Dịka gọọmentị wepụrụ mmachi ngagharị dị n'etiti steeti na steeti ọtụtụ ndị mmadụ amaghị ihe chere ha mgbe ha ga-eme njem okporoụzọ. Onyeisi ngalaba 'Risk Communication' nke 'National Centre for Disease Control bụ NCDC n'aha ịchafụ bụ Disu Yahya Oyewoga gwara BBC Igbo ihe ndị ga-agbanwe na njem ụgbọala n'etiti steeti. Ha gụnyere : Oyewoga kwukwara sị ""ngalaba NCDC, nzụkọ Presidential Task Force (PTF), Ngalaba FRSC na ndị nille nwere aka na njem ụgbọala na-enwe nzụkọ iji tule etu ha ga-esi mee ka iwu njem ụgbọala n'etiti steeti nwee isi"". Ọ kọwakwara na ha ga-enwe nzụkọ a kwa mgbe iji hụ na njem ụgbọala n'etiti steeti ga adị mma. Oyewoga kwukwara sị ""anyị na-enwe kwa nzụkọ ka anyị bipụta atụmatụ ga-eme ka mmadụ niile ghọta usoro njem ụgbọala"". Otu ihe nwereike ime dịka ndị ngalaba nọrọ onwe na-achịkọta njem ụgbọala na Naijrịa bụ National Union of Road Transport Workers ekwuola na ọ bụrụ na gọọmentị ewepụtaghị ụzọ ha ga-eji nyere aka na ha ga-ebuli ego njem ụgbọala. Ngalaba a na-akọwa na ọ bụrụ na ha ga-ebu nanị mmadụ passentị iri ise pekarịa ihe ha na-ebu mbụ na ha kwesiri ibuli ego njem ha ka ha nweta uru. I ji maa atụ, mgbe ewepụrụ mmachị ngagharị n'ime steeti, ndị ọkwaa ụgbọala na-ebubu mmadụ anọ n'oche ma naa ha N300 were si Ajao Estate ruo Obalende kama ma dịka ha tinyere atụmatụ nchekwa coronavirus, ha na-ebuzi mmadụ abụo n'oche ma na-anazị ha N500. Otu onye na-arụ n'ụlọọrụ na-eji ụgbọala ebu ndị mmadụ site na otu steeti gawa ọzọ kwuru na ha agaghị ebido ọrụ ozugbo tupu ha atule etu ya bụ atụmatụ ga-esi metụta ọrụ ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53239579 +business Ọgba mbọ: Ide mmiri nakọrọ m nde kwuru nde ego ma lee etu m si kulie ọzọ - Cassandara Ndulue Ọtụtụ mmadụ na-eji ego achụ ego na-ekwu maka ọdachị ha na-ezute n'ụzọ mana nke Cassandra Ndulue metụtara n'ebe ọjọọ dịka udiri mberede o jir bịa. Ọdoziakụ Ndule si na ya lapuru ụla were tete chọpụta na azụ niile ọ na-azụ a bụrụla ihe ide mmiri buru jewa. Ọ sị na ihe gafere nde naira iri atọ na isii funarịrị ya n'otu ntabi anya. N'akụkọ a, ọ kọrọ anyị njem ya nakwa etu ya Jiri na edi ihe mere nakwa njem o jere iji chọọ enyemaka iji malitekwe ọzọ. Akụkọ ya na-agba anya mmiri mana ọ na-akwalitekwa mmụo ọfụma. Kirie ya n'uju. Ndị mere akụko a bụ Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo. https://www.bbc.com/igbo/afirika-55522250 +business Ihe ndị ahịa na ndị ọrụ njem na-ekwu maka ọnụ ego mmanụ ụgbọala ebuliri Ego mmanụ ụgbọala agbagola n’akụkụ Naịjrịa dị ịche ịche. Na mbụ mmanụ ụgbọala na-adabụ N165 otu litre mana ugbua mmanụ ụgbọala na-ada ọnụ ịche ịche site na mpaghara gaa mpaghara ọzọ. BBC Igbo gagharịrị n’akụkụ Ọwụwa Anywanụ Naịjirịa dị ịcheịche ị ga nyopụta etu ihe gọọmentị mere si emetụta ndị mmadụ. Otu nwaanyị onye ahịa n’Anambra kwuru na ya bụ ihe na-emetụta ya na ezinaụlọ ya n’ụzọ ọjọọ. Ọ kọwara na ya bụ mbuli ego emeela ọnụ ego ime njem, ego ịzụ ihe ahịa nakwa ihe ndị ọzọ etinyekwazịe ego. Otu onye na-anya ụgbọala ‘keke’ kọwara na mkpebị a gọọmentị mere n’elu ọnụ ego mmanụ ụgbọala ji hanwa bụ ndị njem n’aka n’ụzọ ọjọọ. O kwuru na ugbua ndị mmadụ anaghịzị apụta ka si emebụ n’ihi ọnụ ego ihe mmanụ ụgbọala na-adazị. Agbanyeghị na ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ Nigerian National Petroleum Company, NNPC kwuru na ha enyeghị iwu ka ebulie ọnụ ego mmanụ ụgbọala na Naịjịrịa ndị na-ere na ndị na-ebugharị ya bụ ahịa mmanụ kwusiriike na ndị isi ha na ndị na-ahụ maka ahịa mmanụ nyere ha iwu ka ha bulie mmanụ si N165 gaa N175/N179 bụ ọnụ ego otu litre. Ndị na-ere ahịa ekwuola na ọnụ ego mmanụ ụgbọala na-adị eche site n’ebe gaa n’ebe nke so emetụta ahịa ha n’ezigbo ụzọ ọjọọ. Kirie ihe onyonyo a ka ịnụrụ ihe ndị a kwuru n'uju. https://www.bbc.com/igbo/articles/cl45j7vm773o +sports CAF 2019: Naịjirịa ejirila Burundi taa atụ ụtụtụ Otu Super Eagles nke Naịjiria azarala aha nna ha dịka ha ji mmeri mepe asọmpi iko mba Afrịka nke 2019. Ọ bụ na nkeji 77 ka Ighalo jiri otu ọkpụ dọka neeti ndị Burundi. Mba Burundi nwara ike ha ị sata goolu ahụ mana ọ mịtaghị mkpụrụ na ngwụcha asọmpi ahụ. N'ime ihe a niile otu onye aha ya na-ewu ewu bụ Samuel Chukwueze dịka ọ gosiri onwe ya n'asọmpị a. Cheta na Samuel Kalu esoghi ibe ya gbaa bọọlụ taa dịka o koropuru ụnya ahụ mgbe ha na-eme nkuzi. Lekwa ozi Kanu Nwankwo ziri ndị Super Eagles tupu ha ezute mba Burundi. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48733304 +religion Ihe mere eji chụọ ụkọchukwu Anglịkan n'Ezinifite - Aguata Dayọsis "Dịka ọtụtụ mmadụ ka na-ajụ ihe kpatara ndị Ezinifite jiri gbachie ụlọụka Immanuel dị na be ha ụbọchị ụka, ọnụ na-ekwuru Dayọsis Anglịkan nke Agụata agwala BBC ebe mmiri siri banye n'akị oyibo. Abuchi Nwozor sị na okwu ahụ malitere kemgbe afọ 2017 oge Dayọsis ahụ mechara nnyocha were chụọ ụfọdụ ụkọchụkwu ""makana ha na-edina nwoke ibe ha."" ""Ihe mezịrị bụ na ụkọchukwu na-ahụ maka Ezinifite, bụ Emma Ekejiuba, gara ebe a na-akwa ozu wee kwuo na otu n'ime ndị a achụrụ enweghị ihe o mere were kpọọ ya ka o soro ya kpee ekpere.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-54065603 +politics Anambra News Today: APGA akatọọla ogbugbu Ezenwa Nwokenagu na Nnobi Otu APGA ekwuola mwute ha maka ọnwụ otu onyeisioche ha bụ Ezenwa Nwokenagu so na ndị nwụrụ mgbe awakporo ha na Nnobi APGA katọkwara oke mwakpo na-ebiri ọkụ n'Anambra ma kwuo na ọ bụghị agwa a ka e ji mara ndị steeti ahụ. Emeka Ozumba bụ ọnụ na-ekwuchitere otu ahụ bụ onye depụtara nke a n'ozi itiakan'obi o zigaara ezinaụlọ na ikwu na ibe Nwokenagu. Ozumba gwara ndị Anambra ha jụpụ mwakpo n'ụzọ ọbụla kama ha tinye uchu n'ịhọpụta onye ọchịchị dị mma na ntuliaka na-abịa. Nwokenagu bụbu onyeisioche APGA ward 1 n'Uruagu Nnewi dị n'Anambra steeti tupu ọ nwụọ. Ọzọ, Nelson Omenugha bụ onye na-ahazi otu “Youths Earnestly Seek Soludo (YESS) gwara BBC Igbo etu o siri gbalahụ ọdachị n’aka ndị oji egbe wakporo obodo Nnobi dị n’Anambara Steeti, n'ụbọchị 26 nke Septemba 2021. Dịka Maazị Omenugha siri kwuo, ọ bụ n’ihu ya ka ụmụnwaanyị abụọ yi uwe ojii wụrụ mmanụ ọkụ n’ụgbọala ya nakwa nke ndị nchekwa obodo wee mụnye ya ọkụ. Ọ sịkwa na ya hụrụ ndị nchekwa obodo abụọ e gburu na mwakpo ahụ. Ọ sị: “Ka anyị nụrụ ụda egbe aghara aghara, anyị hapụrụ ụgbọala m gbaba ebe anyị gara zoo. Anyị nọ ebe ahụ were na-ahụ ihe na-eme.” Omenugha kwuru na ọ bụ ụgbọala ya na nke ndị nchekwa ka a gbara ọkụ n’ebe ahụ, ma kwukwa na o nwere ụgbọala ọzọ a gbakwara ọkụ n’obodo ahụ nke mere ha atọ. “Ndị mụnyere ọkụ nọ ebe ahụ hụ na ọkụ ahụ gbawara ọfụma tupu ha apuọ.” Ọ sị na ya chebu na ọ bụ sọ egbe ka ndị ahụ na-agba mana o tụzịrị ya n’anya oge ha bịara kụwaa enyo ụgbọala ya ma malite ibupu ngwo ngwo dị n’ime ya. “Ọ tụrụ m n’anya makana a chọbụrụ m ịgbatu oche ụgbọala ahụ zoo n’ime ya.” Maazị Omenugha, dịka ọ na-ekele Chukwu maka etu o si jiri ndụ ya pụta n’ọdachi a, sị na ọ metụtara ajọ ihe na-eme n’Ọwụwa Anyanwụ ugbua. BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara Steeti bụ Tochukwu Ikenganyia ịmata ihe ndị uweojii ma maka ihe mere mana ọ sị na ya enwetebeghị ozi banyere ya. Maazi Ikenganyia mechara binye aka n’akwụkwọ mgbasaozi nke kwuru na ndị omekome ji ụgbọala Sienna nakwa nke a kpọrọ Shuttle Bus gburu mmadụ atọ na Nnobi n’ụbọchị 26 nke ọnwa Septemba. Akwụkwọ ọzị ndị uweojii kwuru na mwakpo a mere dịka ọ fọrọ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere asatọ nke abalị. Ndi uweojii sị na ọ bụ n’ụzọ Afọ Nnobi ka mkpa mkpa a kpara. Ha kwukwara na mmadu atọ nwụrụ na mwakpo a, gụnyere Johnbosco Ojukwu dị afọ 33, Rapuluchukwu Ugoeze dị afọ 30 nakwa Chukwuemeka Nwokebagu dị afọ 31. Maazị Ikenganyia, n’akwụkwọ ahụ o binyere aka, sị na onyeisi ndị uweojii n’Anambara bụ Tony Olofu ezipụla ndị uweojii kara aka ka ha malite nnyocha ma chọpụta ndị kpara ike a. Dịka Maazị Omenugha siri kọwara n’okwu ya, ọ bụ ndị ọrụ nchekwa obodo nọ n'ụgbọala Sienna a gbara ọkụ ka ndị omekome ahụ gburu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58711899 +politics Orji Uzọr Kalu : Akwụ m chịm onweghi ihe na-eme Akụkọ dị mkpa Ndị otimkpu aka chịburu Abia Steeti bụ Ọrji Uzor Kalu ekwuola na ahụ dị ya chịmchịm ugbua dịka ọ gwachara ha okwu n'ekwenti n'oge adịghị anya. Cheta na akụkọ kwuru na nwa amadị mere njem na mba Jamini bụ ebe ọ gara ịwa ahụ n'ihi ọrịa a na-akpọghị aha ya. Akụkọ ọzọ na-eru anyị ntị bụ na Sylvester Dede Ojukwu bụ ọkpara dike Biafra bụ Odumegwu Ojukwu anwụọla n'abalị ụnyaahụ. BBC Igbo kpọtụrụ nwanne ya nwoke bụ Emeka Ojukwu, okwughi ma ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị kama o kwuru na ọ chọghị ịgwa ndị ntaakụkọ okwu. Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na mkparịta ime udo n'etiti gọọmentị na ndị ọrụ ga aga n'ihu echi agbanyeghi abụbụ ọrụ nke ndị ọrụ na-esi ọnwụ ime. Ngige rọrọ arịrịọ ka ndị niile nke gbasara gbalịa bịa nzukọ ahụ maka i ji gbo nsogbu ọgwụ opekatampe ndị ọrụ. Anya anyị ga-acha ọbara n'ụbọchị Nov 6 - NLC Akwa dara na mba Ijipt dịka ndị mmadụ gbakọtara ili ndị ụka kraịst asa a gbagburu n'ebe ha gara ikpe ekpere na njem ala nsọ ha mere. Ndị agha nnupuisi Islamic State kwuru na aka ha dị n'ọnwụ mmadụ asa ndị a. Manchester United lara na nta dịka ha si na-azụ were ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ndị AFC Bournemouth n'asọmpi Iko Premier. N'aka nke ọzọ, anya niile na-ele ka eke ga-esi anya anwụ n'asọmpi ga-adị n'etiti Arsenal na Liverpool n'abalịa. Leekwa ihe nkiri otu nwoke a sị daa mmiri na Legos Ibe anyịnụ, pati APC akụwala akị oyibo nsugbe site na inye INEC aha Hope uzodimma dịka onye ga-ebutere pati ha ọkọrọtọ na ndọrọndọrọ ọchịchị gọvanọ Imo Steeti 2019. Adams Oshiomhole bụ onyeisi APC kwuputara nke a ụbọchị Fraịde bụ ebe ọ nọ kwuo na ihe ya mere bụ ihe ụlọikpe ukwu kwuru. Mana akụkọ a na-anụzi ugbua bụ na ụlọikpe ukwu dị n'Abuja egbochiela Oshiomole na kọmitee ọrụ nke APC i ziga aha ọbụla na-abụghị aha Uche Nwosu nye ndị INEC. Ụlọikpe gakwara n'ihu nye ndị INEC iwu ka ha ghara ịna-abata aha ọbụla na abụghị aha Uche Nwosu dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti. Anyị agaghị ekwe o, Anyị agaghị ekwe! Ndị ụka Anglikan bụrụ ngagharị iwe ụbọchị frịade bụgara gọvanọ Anambra steeti bụ willie Obiano na ebo ya ebubo na ọ were ụlọakwụkwọ ha bụ Bishop Crowther Primary School nyefee ndị katọlik na'aka. N'ofesi onyeisiala mba Turkey bụ Recep Erdogan akachiela obi tụọ mba Saudi Arabia aka dị ka ndị gburu Jamal Khashoggi bụ onye nwuru na Turkey. Chioma:Nchọpụta ndị Turkey mere na-egosi na atọgbụrụ ya bụ nwaamadị bụ onye nọ na ọsọ ndụ ka ọ gara iwete akwụkwọ ikike maka agbam akwụkwụ nwunye ya n'obi nnọchite anya mba ha na Turkey. N'ofesi, onyeisiala mba Turkey bụ Recep Erdogan akachiela obi tụọ mba Saudi Arabia aka dị ka ndị gburu Jamal Khashoggi bụ onye nwuru na Turkey. Nchọpụta ndị Turkey mere na-egosi na atọgbụrụ ya bụ nwaamadị bụ onye nọ na ọsọ ndụ ka ọ gara iwete akwụkwọ ikike maka agbam akwụkwụọ nwunye ya n'obi nnọchite anya mba ha na Turkey. N'egwuregwu N'egwuruegwu, kepukepu na-eru anyị ntị na-akọ na ndị otu egwu bọọlụ nwere agba na Europe na-agba izu ka ha ga-esi mailte asọmpị ọzọ akpọrọ Super League n'afọ 2021. Ka ọ dị ugbua onwebeghị ọnye kwere iti aka n'ala na nke a bụ eziokwu bụ ama a akwụkwọ akụkọ Der Speigel gbara. Akụkọ ndị a ga-amasị ịgụ tata https://www.bbc.com/igbo/afirika-46082476 +health World Aids Day 2019: HIV n'ọnụọgụgụ "Ụbọchi mbụ nke ọnwa Disemba bụ ""World Aids Day"" - bụ oge e ji agbasa ozi maka agha a na-ebuso ọrịa a. HIV ka na-aga n'ihu ịbụ nnukwu ihe na-enye ahụike nsogbu n'ụwa gbaa gburugburu. Ihe ruru mmadụ nde 32 anwụọla site n'ọrịa a kemgbe ọ malitere. Mana, ya bụrụ na ndị na-arịa ọrịa na-enweta ọgwụgwọ dị ire, ọrịa a ga-abụ ihe a na-ejikwatanwu ejikwata. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50614393 +health Gịnị mere ụmụ Naijiria na-agbagha ọnụọgụgụ coronavirus NCDC na-ewepụta? "Kemgbe abalị ole na ole gara aga, mpụtara ngụkọ 'National Centre for Disease Control (NCDC)' ọnụọgụgụ gbalitere n'ụzọ pụrụ iche, ụmụ Naijiria ji enyo ele ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naijiria. Nke a bụ n'ihi ngụkọ ha wepụtara n'abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ nke gosiri na mmadụ 11,118 gbakere n'ọrịa coronavirus n'otu abalị dịka o ha kwuru na mmadụ 31851 agbakeela kemgbe ọrịa coronavirus ji bata Naijiria. N'abalị atọ nke ọnwa Ọgọstụ, NCDC wepụtara mmadụ dị 20663 dịka ndị gbakerela n'ọrịa coronavirus. Ya bụ nnukwu mgbanwe gbara ọtụtụ mmadụ baa, ma mee ka ụfọdụ kwuwe na o nwere ike ịbụ ndehie. Mana ka otu abalị gara NCDC na ndị ọrụ ya ekwughị na o nwere ndehie ọbụla ha mere, ụmụ Naijiria bidoro ntamụ, ụfọdụ na-ajụ ebe akatamkpo ọnụọgụgụ ahụ si. Ihe kachasị gbagwojuo ndị mmadụ anya maka ngụkọ ahụ bụ na ọtụtụ ndị ahụ a sị gbakere si na Legọs. Malachy Ani, onye ihe gbasara ngụkọ ego doro anya sị na ""ndekọ ahụ ha na-enye anyị abụghị ezi ya, ọ dịka wayo"". Anị gara n'ihu sị , ""Ndepụta ngụkọ na-ele ya kwa ụbọchị dị iche n'ụzọ pụrụ iche na nke a na-edepụta kemgbe ọrịa coronavirus batara Naijiria."" ka o kwuru ""O nwebeghị ụbọchị iri mmadụ ise gbakere n'otu ụbọchị, kedụ ka mmadụ karịrị puku iri na otu si gbakee n'otu ụbọchị."" ""Ihe o gosiri bụ na ndị na-enye anyị ngụkọ a anaghị etinye anya n'ọrụ."" Ani jụrụ ajụjụ sị, ""Ọ bụrụ eziokwu na ndị ahụ gbakere n'ezie, a sị ha lawa, kedụ ebe ndị ahụ si were la."" Data kwesịrị inye anya aka n'ịtụ alo, mana ụdị ngụkọ onweghị ihe anyị ga-eji eme."" Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwukwa otu ahụ na soshal midia. Ụfodụ na-ebo gọọmenti ebubo ime wuruwuru, o nweghị mgbe ọrịa ji dị na Naijria kama ndị ọrụ gọọmenti ji ụgha a kpara ego. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ dịka ego a mapụtara maka ibu agha megide coronavirus agwụla nke mere ka ndị ọrụ gọọmenti ọ dị n'aka ji agwọkọ ngwongwo ha. NCDC kọwara na ọtụtụ ndị ndị gbakare na Legọs bụ ndị a nọ n'ụlọ ha eleta. Onyeisi NCDC bụ Chikwe Ihekweazu kwuru na nsonso dịka ndị mmadụ na-adọrịta ụka ebe 11,1888 si na, NCDC nyere steeti ga-ugboro ha ga-agbaso maka ileta ndị bu ọrịa n'ụlọ ha. Otu n'ime ọnụ na-ekwuruchitere onyeisi NCDC bụ Emeka Oguanuo gwara BBC na ndị ahụ gbakerela sokwa n'ọnụọgụgụ ndị e kwuburu na ha butere nje coronavirus." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53684971 +entertainment Tiwa Savage na Charles Anazodo: Ihe ekele ji dị mkpa n'ala Igbo "Charles Anazodo bụ ome ihe onyonyo Nollywood a ma ama bụ okwu akpụ n'ọnụ ugbua maka ihe o dere na soshal midia. Anazodo kwuru na Tiwa Savage enweghi nsọpụrụ n'ihi na ọ keleghị ya mgbe ọ hụrụ ya n'otu ụlọọrụ mgbasaozi. Tiwa Savage bụ otiegwu a ma ama sara ya na-ajụ onye ka ọ bụ o jighị ga-ebu ụzọ kelee ya? Ihe a gara n'etiti ha mere anyị ji na-ajụ: Kedụ uru ekele bara n'ala Igbo? Otu onye bụ ọkachamara n'omenala Igbo bụ Ositadinma Amakaeze gwara BBC Igbo ihe niile ekele pụtara. Ihe mbụ o kwuru bụ na ""ikele mmadụ bụ omenala Igbo, a tụrụ anya na ọ bụ nwata ga-ekele okenye."" O kwuru na ihe ekele dị mkpa n'ihi na ọ bụ ajụjụ ga-enwe asịsị ma nye ohere ịkwu ka ihe siri dịrị gị. ""Ekele bụ ohere ga-ebute mkparịtaụka n'etiti ndị mmadụ"" bụ ihe ọzọ o okwuru Nke a ga-ebute mmekọrịta nke Bekee kpọrọ ""Communion"" n'Igbo niile nakwa n'Afrịka. Ihe ọzọ ekele na-egosi bụ obioma ịnwere ebe mmadụ ibe gị no ""Ọ naghị eme ị makwa onye mbụ dịka onye na-eme mpako,"" ka ọ kọwara. N'okwu Tiwa Savage na Charles Anazodo, ọ kọwara na ndị a ma ama nwere akparamagwa pụrụiche. Ọ sị na ọ bụkwa agwa ahụ nwereike ịme ka Tiwa mee ihe o mere n'abụghị ihe o bu n'uche." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49931404 +sports West Ham vs Man United: E tiela Man United ka ịgba udubọnch Ihe na-ebe ka na-ebe n'ụlọ ndị Manchester United nọ dịka West Ham United ji ọkpụ goolu abụọ merie ha n'asọmpi Premier League. West Ham kpọbatara Man United n' ụlọ ma were ọkpụ goolu abụọ asataghị otu kụọ ha ihe okenye kụrụ nwata dịka ụmụaka. Nke a malitere mgbe Andriy Yarmolenko nke West Ham ji goolu mba maa Man United aka ntị na nkeji 14. Man United siri ọnwụ dịka nkịta a na-achọ igbu mana West Ham kelara aka n'azụ. Nke a megidere ruo n'ọkara nke abụọ n'ime asọmpi a mana Onweghi onye nyere ibe ya goolu ọzọ. N'ime nkeji 84 ka ọ fọrọ nkeji isii ka e gbuchie bọọlụ, West ham nyere goolu nke abụọ site n'aka Aaron Cresswell. Site na mmeri a, West Ham United bụ ndị anọ n'ogogo tebụlụ ebe Man United bụ ndị asaa. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49789304 +entertainment Love Relationships: Lee ihe anọ ga-eme ka nwoke ghara ịchụ nwaanyị "Ụfọdụ oge ka ị ga-anụ ebe nwoke na-agba n'ezi na-ekodo aka n'ihe dị icheiche ikwu na ọ bụ ihe mere o ji eme ihe ọ na-eme. Ọtụtụ n'ime ndị na-akpa agwa a anaghị eche maka ọnọdụ nwunye ha lụbatara n'ime ụlọ nọ n'ime ya ka ha na-eme etu a n'ihi na ọ bụ nke masịrị ha ka ha chọrọ. Mana ụfọdụ ndị na-akpa agwa a amaghị na e nwere uru dị n'ịchịba ụkwụ n'ụlọ, biri n'udo dịka di na nwunye, na-agbaghị n'ezi. Ị na-ajụ 'kedụ uru nwanụ'? Ngwa lee ha ebe a: 1) Ọ ga-akpịtara gị ego: Ị tinye anya gị naanị na nwaanyị ị lụrụ alụ nke gị na ya bi n'ụlọ, ị gaghị na-atufu oke ego. Onye ọbụla ma na ịchụ nwaanyị na-ebute ntufu ego; nke bụ na ị ga na-enye nwaanyị ahụ ị na-achụ ihe niile ọ chọrọ n'ihi na ị chọrọ ime ya obi ụtọ. Marakwa na ụfọdụ 'na-azụ' enyi ha nwaanyị ma na-elekọtakwa nwunye ha na ezinaụlọ ha. Mana nwanne ọ bụrụ naanị n'ahụ nwunye gị ka anya gị dị, ị mara na ị gaghị eke ego na akụnaụba gị ụzọ abụọ. Makana odoziakụ gị ga-eji ego ahụ mepụta ihe ị hụrụ anya, n'ụzọ ga-amasịkwa gị. 2) Ọ ga-akwudo gị n'akụkụ ma n'ụbịam ma n'akụnaụba Gị na-agụ akụkọ a kwuo eziokwu, ugboro ole ka ị hụrụla maọbụ nụ akụkọ nwoke na-agba n'ezi enyi ya nwaanyị wụsara ya n'ala n'ihi na ọ naghị enyezi ya ihe ọ chọrọ? N'ihi na ọtụtụ oge ego ka ụmụnwoke na-eji achụta nwaanyị na-abụghị nwunye ha, ọ na-abụ ihe ntakịrị dịka ọdachi dapụtara ha, enyi ha nwaanyị ahụ ewee mwemwe ọsọ mgbe ọ hụrụ na ego adịghịzịkwa gị n'aka ọzọ. Mana ọtụtụ oge ka nwunye ha lụrụ na-enwere ha ndidi ma ihe isiike dapụtara ha. Ha na-echeta nkwa ha kwere mgbe a na-ejikọ ha n'ụlọụka ebe ha kwuru na ha ga-ahụ di ha n'anya ""ma n'ụbịam ma n'akụnaụba"". Ọ bụkwa nwaanyị ị lụbatara n'ụlọ ga na-ekpuchi gị ka ihere ghara ime gị ma ụwa gị tụgharịa. 3) Ụjọ ọrịa agaghị na-atụcha gị: Ị na-anụ mgbe ọ na-abụ a na-ejikọ di na nwunye n'ụlọụka ha ekwe nkwa ""ilekọta gị ma n'ọrịa ma n'ahụike""? Ị bụrụ onye na-achụ nwaanyị, mgbe ọrịa dị aṅaa bịara gị ka ị ga-ama ma nke a ọ bụ eziokwu ma ọ bụ asị. ���tụtụ oge, ụdịrị ọsọ nwaanyị ahụ ị na-achụ ga-eji wụsa ihe niile gbasara gị wee gbafuo, ị ga na-ajụ ""kedụ onye m mejọrọ n'ụwa?"" Ọ bụkwa nwaanyị ahụ ị lụbatara n'ụlọ na-anọkarị, lekọta gị n'ọrịa ahụ ma na-ekpekwa ekpere ka ụdịrị ihe a ghara ịdakwasị gị ọzọ. 4) Ihe ị na-achọ n'uko elu dị n'uko ala: Kwuo eziokwu, kedụ ihe na-eme ka ị chụrụ nwaanyị pụọ n'ezi? Ọ bụ mma? Ezigbo ahụ? Amamihe? Ịhụnanya? Ọ bụrụ na ị na-agwa onwe gị eziokwu ị ga-ama na ọtụtụ oge ihe ahụ ị na-achọ n'ezi nọ n'ime ụlọ gị. Ụfọdụ oge ị naghị ahụ ya n'ihi na ị chọghị ịhụ ịhụnanya nwunye gị bụ nwaanyị mụrụ nwa/ụmụ gị, na-egosi gị. Mana ị ma na ị na-egosikwa nwunye gị ịhụnanya ọ na-egosi gị, na enweghị ihe ị chọrọ ka o mee ọ na-agahị emere gị? Ụfọdụ oge ka ị ga-ahụ ka ụmụnwaanyị ndị buru ibu na-agba mbọ ịta ahụ ka ha nwee ike ịdị ka ụdịrị nwaanyị di ha na-achụ n'ezi. Nke a bụ ọmụmaatụ ihe ịhụnanya nwereike ime. Ihe ndị ọzọ dị iche iche kwesịrị ime ka nwoke ghara ịchụ nwaanyị maọbụ gbaa n'ezi. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51450720 +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Anthony Joshua eritela ntulugo ọhụrụ Okwu APC na Okorocha ka na-aga... Otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC adọọla aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha aka na ntị maka ịbo onyeisioche ha ebubo dị ịcheiche Cheta na Okorocha boro onyeisioche APC bụ John Odigie-Oyegun ebubo na o kwanyeghị iwu ụlọikpe nyere gbasara ntụliaka imeụlọ APC na steeti ya ugwu. Ọzọ Ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara akụnụba ọha esila n'ọnụ onyeisi ha bụ Alex Okoh kwuputa na gọọmentị na-akwado ịre ọtụtụ akụnụba Naịjirịa. Okoh kwuru na nke a bụ ịji leta ego a ga-eji mezuo bọjeti nke afọ a. Na mba ofesi, Ndị e chere na ha bụ ndị oyiegwu Al-shabbab egbuola onye agha mba Amerịka na ndịda mba Somalia taa. Ndịagha Amerịka ndị ọzọ merụrụ ahụ mgbe a wakpọrọ ha n'obodo Kismayo. N'egwuregwu, Nwa-afọ Naịjirịa ama ama n'egwuregwu ịpịa ọkpọ bụ Anthony Joshua eritela ntuliugo a kpọrọ 'Order of the British Empire'. Ntuliugo a bịara ya n'ụbọchị ncheta ọmụmụ ezenwaanyị mba Britain ma cheta kwa n'oritela ntuliugo yiri nke a bụ MBE maka ike ọ kpara n'asọmpị Olympics n'afọ 2013. Gee akụkọ mere n'ime otu nkeji n'ụtụtụ a: Ihe ọzọ ị kwesiri ị ma: Kanayo O. Kanayo na-akwado ị zọ ọchịchị ọkwa ụlọomeiwu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-44423393 +health Coronavirus domestic violence: Ịzọpụta onwe gị n'aka onye na-emegbu gị n'ime 'lockdown' a "Ngalaba na-ahụ maka ọdịmma mbaụwa bụ United Nations ekwuola na mmegbu ụmụnwaanyị oge mmechi obodo bụ ihe a kpọrọ ""shadow pandemic"" n'asụsụ Bekee. Na mpaghara Afrịka, ndị ọchịchị, ndị uweojii na ndị na-ahụ maka ikike dịrị onye ekwuola na mmegbu ụfọdụ ụmụnwoke na-emegbu nwunye ha na enyi ha nwaanyị bịara na-arị elu dịka a banyere na mmechi obodo a. Mana gịnị ka ị nwereike ime onwe gị n'ụdịrị ọnọdụ a? Anyị jụrụ ndị ọkachamara nakwa otu nwaanyị si na mmegbu zọrọ isi onwe ya, ebumnuche ha na ndụmọdụ ha. ""Ị nọrọ n'ime mmegbu, ị ga-ahụ na e nwere usoro ihe si aga, Esther (ọ bụghị ezigbo aha ya) gwara m, dịka ọ na-echeta afọ atọ ya na onye ọ lụburu na-eti ya mmọnwụ oge ọbụla - ma iti ya ihe nakwa ịkpọgbu ya n'iyi. ""Na ngwụcha izuụka ka ọ na-ejikarị aka njọ, makana mgbe ahụ onye ọbụla ga-anọ n'ụlọ. Mgbe ahụ ka onye ọ bụ gị na ya ga-enwe ọtụtụ oge ọkachasị ma ọ bụrụ na ike ịnọ n'ụlọ agwụla ya. Nke bụ na ị ga-ahụ na ha chọrọ ịchọ okwu. Ha ga-akpara gị nkata - ihe dịka ikwu okwu ga-akpalite gị ka ị nwee ike saa ya ma tizie gị ihe mgbe ị sara. ""Ọ bụrụ na ụbọchị abụọ nwereike ime ka onye ike ịnọ n'ụlọ gwụrụ chọọ iti gị ihe, chezie uche ihe otu ọnwa na ụma a sị ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ apụtala ezi buterela ndị mmadụ. Nke ugbua abụghịzị naanị ike ọgwụgwụ ịnọ n'ụlọ, ọ bụ ma mgbakasị ahụ ma ụjọ."" Ọtụtụ afọ agafeela ugbua kemgbe Esther kwarala ibu ya hapụ di ya. Mana mgbe ahụ, ọ kadị mfe isi na mmegbu ahụ gbalaga karịa etu ọ ga-adụ ugbua, ọ ga-ewe oge na obisike. ""Ọ dị m ka m nọ na mkpọrọ ebe m agaghị esinwu pụọ makana ihe rara ahụ, ma akụnụba o, ma ọnọdụ echiche obi, ma n'ọnọdụ echiche ụbụrụ - ma gụnyekwa ụmụ m. Ọzọkwa, nne gị ga na-enwe aṅụrị na ị lụọla di, nke bụ na ị ga na-eche - ekwela ka aṅụrị ya kwụsị. Nọrọ."" Maka ụmụnwaanyị chọrọ ịhapụ di ha na enyi ha nwoke n'oge mmechi obodo a, ọ ga-ara ha ahụ karịa. Ha chọọ ịpụ, ndị uweojii nwereike ịgwa ha na ha dara iwu onye apụtala ezi, ọzọ bụkwa na o nwereike ịra ha ahụ ịhụ ụgbọala ga-ebu ha. Ọtụtụ mba ewepụtala akara ekwentị mgbata ọsọ enyemaka, maka inye ndị na-agabiga mmegbu ndụmọdụ nakwa inyere ha aka. Ndị na-achọkwanụ ha maka enyemaka a dị ọtụtụ. 'Ndị a na-emegbu emegbu na-arị elu' N'isi mbido oge a machiri ịpụta ezi na mba Saụt Afrịka, ndị uweojii natara mkpesa 2,320 gbasara mmegbu ụmụnwaanyị - nke ji pasentịụ 37 karịa ka ha na-enwetabu mbụ. Na mba Zimbabwe, otu ụlọọrụ ekwentị mgbata ọsọ enyemaka ahụ kwuru na ọnụọgụgụ mkpesa ha nwetara ji okpukpu atọ karịa, ebe Dorothy Njemanze bụ onye bu ihe gbasara ikike dịrị onye n'isi, gwara BBC News na etu ọnụọgụgụ ndị a na-emegbu emegbu na Naịjirịa si arị na-eche ya uche: ""Ụjọ na-atụ anyị na ọ dịrị etu a na-aga, ndị mmadụ nwereike ịnwụ tupu e mepee obodo ọzọ."" Ụfọdụ mba dị n'Afrịka ewepụtala ụzọ a hụrụ anya e ji enyere ụmụnwaanyị aka. Na Tunishia, ebe mkpesa maka mmegbu n'ime ụlọ jirila okpukpu ise karịa etu ọ dịbu, gọọmentị ewepụtala akara ekwentị gbatagbata ma wepụta ebe mgbaba asatọ maka ndị a na-emegbu nakwa ụmụ ha, na-ekwukwa sị chebiri ụlọ mgbaba ndị ọzọ. N'ụfọdụ ebe ndị ọzọ, e mepere ọtụtụ ebe mgbaba ma nwekwaa ndị wepụtara onwe ha inyere ụmụnwaanyị aka igbafu. Na Zimbabwe, ndị okenye 21 na ụmụaka asaa ji ụlọọrụ Roots One Stop Shelter mere ụlọ mgbaba. Beatrice Savadye bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ kwuru na ha na-agba mbọ ịkpọpụta ụmụnwaanyị ahụ n'ụlọ ebe a na-emegbu ha. Ndị uweojii na-akpọnyekwa ha ụfọdụ. 'Ebe mgbaba ụmụnwaanyị' Na Kenya, Dianah Kamande bụ onye ọrụ ya bụ inyere ndị mmadụ aka, kwuru na ndị nwere ụlọ mgbaba ka na-anabata ụmụnwaanyị, ma kwuo na ụlọọrụ ya anabatala ụmụnwaanyị 17 naanị na Naịrobi. Na Naịjirịa, n'agbanyeghi na ọtụtụ ebe mgbaba ụmụnwaanyị mechiri n'ihi mmechi obodo e tinyere, ndị na-enye aka n'efu ka na-enyere ụmụnwaanyị aka ịgbapụta ma lakwuru ezinaụlọ ha, dịka Titilayo Vivour, bụ onye na-achịkọta ngalaba na-ahụ maka mmegide mmadụ na Legọs steeti bụ Domestic and Sexual Violence Response Team, si kwuo. Mana maka ebe mgbaba nke Ghana bụ Ark Shelter, Nana Sunnu bụ onye na-achịkọta ya kwuru sị na ha enweghi ikike ịnabata ndị ọhụrụ n'ihi ụjọ mbufe ọrịa coronavirus nakwa enweghi ebe a ga-edopu ndị mmadụ iche. Esther bụ onye si na mmegbu gbapụta ma soro ndị ọzọ gbapụta na-arụ ọrụ ugbua, kwuru sị ka ụmụnwaanyị na-akpọ akara ekwentị ndị e wepụtara ma ọ bụrụgodi na ha nọ na mba ndị ụlọ mgbaba ha mechiri emechi. ""Gbalịa kpọkuo ndị na-ebu ikike dịrị onye n'isi site na soshal midia, ndị nke ị nwere ịtụkwasị obi. Kpọo ha, ha nwereike inyere gị aka tụmadị n'ime mmechi a."" Nthabiseng Ramothwala bụ onye na-ahụ maka ọnọdụ ahụike ụbụrụ mmadụ na Saụt Afrịka kwuru sị na ọ dị mma ka ndị mmadụ na-enyere ndị agbataobi ha nwereike ịnọ na mmegbu. Ọ dụkwara ụmụnwaanyị ọdụ ịrịọ ndị gbara ha gburugburu enyemaka. ""Mara ndị uweojii nakwa akara ekwentị ndị ị nwereike ịkpọ,"" ka ọ gwara BBC. ""Mee ka ndị agbataobi gị marakwa, gwa ha ihe nhụwa ama ha ga na-elepụ anya iji mara mgbe ha ga-eji gbatara gị ọsọ enyemaka. Nye ha akara ekwentị ezinaụlọ gị ndị nwereike ịbịa zọpụta gị."" 'Anyị na-agba mbọ ịzọ onwe anyị ndụ' Maka ndị enweghi ụzọ ha ga-esi gbapụta, Esther nyere ha ndụmọdụ. ""Ị kwesịghị imechi ọnụ n'ihi na ị chọrọ ka onye ọzọ nọrọ mma, mana n'ọnọdụ a, ọ bụrụ na ha kwuo ihe fụrụ gị ụfụ, gbachị ha nkịtị. Ha kpasuo gị iwe gaa gụọ akwụkwọ maọbụ mee ihe ọzọ iji wepụ obi gị ebe ha nọ. ""Ọ bụrụ na ị ga-editenwu otu ọnwa na abụọ maọbụ atọ na-abịanụ... mee ihe ọbụla ị ga-emenwu ga-enyere gị aka idi ya. Amaghị m ma anyị a ga-akpọnwu atụmatụ ndị a ngwọta. Ha bụ naanị ihe nwa mgbe nta. ""Ugbua, naanị ịzọ ndụ ka anyị na-agba mbọ ya, ya bụ na ị ga-ekwu ihe ha chọrọ ịnụ, mee ihe ha chọrọ ka ị mee, ka ị wee dịrị onwe gị ndụ.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-52675213 +business Personal Finance: Uzọ ị ga-esi chekwatụ ego gị maka ọdịnihu- Ọkachamara Onye nhazi ego (Personal Finance expert) bụ Uche Iheanacho gwara BBC Igbo na ọ ka mma iwepụta otu n'ụzọ iri n'ime ihe onye na-enweta ma chekwa ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-49485708 +health Dandruff, Scalp psoriasis, Ringworm na ihe ndị ọzọ na-eri ntutu gị "Ọt��tụ oge ka ị ga-ahụ ebe mmadụ na-akụ isi ya kpakam kpakam chee na ọ bụ inyi dị ya n'isi na-akọ ya ọkọ, mana ha amaghị na ọ bụghị naanị na ntutu ruru inyi mere ihe ji ata mmadụ n'isi ahụ. Ụfọdụ ndị na-eche na ọ bụ akwọsaghị mmiri n'isi nwereike ime ka isi na-akọ mmadụ ọkọ, ebe ụfọdụ na-eche na ihe niile na-eme ka mmadụ na-akụ onwe ya aka n'isi n'ihi ọkọ na-akọ ya bụ na ""igu dị ya n'isi"" maọbụ na ""dandruff na-enye ya nsogbu"". Mana ị ma na e nwere ihe ruru ọrịa iri na-ata mmadụ arụ n'isi, nke ụfọdụ n'ime ha na-erikwa ntutu mmadụ, na-eme ka ọ na-adasịsị maọbụ ghara ito ogologo? Akụkọ a ga-akọwara gị ihe ndị ahụ na-eri gị nri n'isi nakwa ụzọ ị ga-esi nyere onwe gị aka. Ọ bụ eziokwu na ị ga-ejinwu ihe e ji agba n'ahụ agba n'isi n'ihi na ala isi gị na anụahụ gị bụkwa otu, mana ọtụtụ mmadụ amaghị nke a. Ụfọdụ ihe ndị a na-ata mmadụ isi nwekwara ndị nke na-ata n'ahụ, nke bụ na i were ihe ị ga-eji luso nke dị gị n'ahụ luso nke na-ata gị n'isi, o butekwa ụdịrị ọgwụgwọ ọ ga-enye gị n'ahụ. Sebhorric Dermatitis bụ ọrịa na-ebute oke ọkọ n'isi, nke na-eme ka ala isi mmadụ na-acha ọbara ọbara. Ọ na-adị ka nke Bekee kpọrọ ""dandruff"", mana ebe o si ka njọ bụ na ọ na ọ na-amụba amụba n'isi; o nwekwara ike ime mmadụ ma n'ihu ma n'obi ya (ebe ndị Bekee kpọrọ ""sebaceous areas""). Ebe ọrịa a si ka njọ bụ na ọtụtụ ndị bu ya akpagharị amaghị na ha bu ya. Ọ na-emekwa ma nwoke ma nwaanyị, ọkachasị ndị nwere ntutu. Ọ na-ebidokarị mgbe mmadụ ka malitere ntoroọbịa, mana ndị ọkachamara kwuru na ọ na-akacha enye ụmụnwoke nsogbu. Ụfọdụ oge ọ na-emekwa ụmụaka a mụrụ ọhụrụ, mana ọ naghị anọte aka tupu ọ laa. Ebe o si dị mma bụ na ọ naghị esi na nne na nna fere na nwa. Gịnị na-ebute ya? E nwere Yist a kpọrọ ""Malassezia"" na-ebi n'ahụ mmadụ nke nwereike ịmụbawanye wee bute ọrịa a. O nwekwara ike ibido ma ọ bụrụ na ihe na-alụso nje ọgụ n'ahụ mmadụ mekarịa ka o si eme ma Malassezia a metụta ya. Ihe na-akpalite ya gụnyere ike ọgwụgwụ nakwa oke ndọkasị ahụ. Ọzọ bụkwa na ọ na-aka akpa ike n'oge njụmoyi karịa na mkpomọkụ. Ọ bụghịkwa ihe mmadụ na-eri na-ebute nke a. Etu e si agwọ ya E ji ihe ndị na-akụda yist ahụ agwọ ya, ihe gụnyere ncha e ji asa isi nakwa ude ọpụrụiche nke a na-arụpụta maka ọgwụgwọ ya. A na-agwọ ya agwọ mana o nweghi ngwọta. Nke bụ na mgbe ị kwụsịrị ịgwọ ya, ọ ga-abịaghachite; mana ala isi gị malite ịchapụ ọcha, ka na-eji ncha isi na-ebughi 'fụngaị' na-asa isi gị ma na-etekwa ude mmiri (moisturiser) kwa izu iji kwụsị mbịaghachite ya. Ọzọ bụkwa na ụfọdụ na-eji maka ya aga ụlọọgwụ ka e nyochaa ma gw ha etu ha ga-esi lekọta ya. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ mgbe isi na-akọ mmadụ ọkọ, na ọ bụ dandruff ka ọ na-arịa, mana o nweghi ihe mebiri n'ihi na ọ naghị efe efe. Ọ bụkwa eziokwu na dandruff na-adasịsị na-adakwasị n'elu akwa ma ị na-akọ ọkọ (ị na-akọ ọ na-atọ gị), mana nke a nwere ngwọta. Gịnị na-ebute ya? Otu ihe ị ga-ama bụ na ọ bụghị iru inyi na-ebute dandruff, mana ọ na-aka apụta ihe ma ọ bụrụ na ị naghị asa isi gị kwa mgbe. Mana njụmoyi nakwa ndọkasị ahụ na-eme ka nsogbu ya karịa. Ihe a kpọrọ Malassezia globosa bụ ihe na-ebute dandruff, nke na-eri mmanụ dị na ntutu nakwa n'ahụ mmadụ. Etu e si agwọ ya Chọọ ncha e ji asa isi nwere ọ bụrụgodi otu n'ime ihe ndị a: zinc pyrithione, salicylic acid, selenium sulphide (maọbụ selenium sulfide), ketoconazole nakwa coal tar. Na-asa isi gị ọ bụrụgodu ugboro abụọ n'ime otu ọnwa; ị tinye ya ncha ahụ hapụ ya ka ọ nọruo nkeji ise maọbụ iri tupu ị sachapụ ya. Ị hụtụla ebe mkpu pụrụ ndị mmadụ n'ọnụ n'ihi na otu onye tọpụrụ isi ọ kwanyere? Nke a bụ otu ọnọdụ scalp psoriasis nwere ike itinye gị n'ime ya. Ọrịa nke a na-asọ itinye ihe Bekee kpọrọ ""Synthetic"" n'isi onye ojii, (gịnị ka nwaanyị ga-etinyezi n'isi ya ebe ọ bụ ya ka e ji emepụta ma ""attachment na weavon"" ụfodụ e ji eme isi?) Ọ na-abụ i tinye ihe n'isi gị ọ malite ikpekasị ma na-akọ gị ọkọ, mana ị kọọ ya ọkọ o nwere ike imerụ gị ahụ maọbụ mee ka ebe ahụ na-akọ gị ọkọ na-acha ọbara ọbara. Ị sịkwanụ ka ị kụwa isi gị kpakam kpakam, ị nwere ike ịkụta isi ọwụwa. Gịnị na-ebute ya? Ndị ọkammụta na-eche na scalp psoriasis na-abịakarị site na mgbe ihe na-alụso nje ọgụ n'ime ahụ mmadụ anaghị arụsi ọrụ ike, nke bụ na mkpụrụndụ nke T ọrụ ya bụ ị na-alụso nje na ọrịa ọgụ ga-ahapụ ya bụ ọrụ ma lụso mkpụrụndụ nke dị mma ọgụ, nke na-eme ka ọ mụbawanye. Mkpụrụndụ ndị ahụ na-apụtazị n'anụahụ mmadụ ebe ọ na-eme ka ọ chaa ọbara ọbara, zaa aza, na-ekpekasị ekpekasị ma na-akọ ajọ ọkọ. Ha na-echekwa na ọ na-esi na mkpụrụndụ efe efe ma ọ bụrụ na nne na nna onye nwere ya. Ọzọ bụkwa na etu onye si ebi ndụ na-ebutekwa ya; dịka onye na-ese anwụrụ, onye aṅụrụma, onye buru oke ibu nakwa onye nọ n'oke ihe mgbakasị ahụ nwere ike ibute ya. Etu e si agwọ ya Scalp psoriasis na-eri ntutu mmadụ, mana ọ na-etochikwa ma ọ bụrụ na onye nwere ya na-elekọta isi ya ọfụma. A na-eji ihe ndị nwere Anthralin, Calcipotriene, Betamethasone, Tazarotene, Methotrexate, Oral retinoids n'ime ọgwụ ọṅụṅụ, agwọ ya. Ọzọ bụ nke a kpọrọ Phototherapy. Ị nwekwara ike iji ụfọdụ ihe dị n'ụlọ gị gụnyere aloe vera, apple cider vinegar, baking soda, mmanụ akị oyibo, garlic, oatmeal, nnu epsom, turmeric nakwa mmanụ osisi tii agwọ ya. 4) Ringworm (Tinea Capitis) Nke a bụ nke ndị Igbo na-akpọ ọkpụ isi oringo. Ọ bụ eziokwu na ikpuru dị n'aha ya (ringworm), mana ọ bụghị ikpuru na-ebute ya bụ ọrịa. Ọ na-egosikarị dịka ihe gbara gburugburu na-acha ọbara ọbara, na-erikwa ntutu mmadụ ihe o richatara. Ọ na-efe efe site na mmadụ fere na mmadụ nakwa anụmanụ, ọ na-emekarị ụmụaka mana ọ na-emekwa okenye. Gịnị na-ebute ya? Ọ bụ nje a kpọrọ dermatophyte na-ebute ya, nke na-eme ka ọ na-akọ ezigbo ọkọ. Etu e si agwọ ya Ọtụtụ oge a ga-eji agụba a ga-atụfu ozugbo kpụchaa gị akụkụ isi ebe ọ na-eme gị tupu agwọwa gị ya, mana ozi ọma bụ na o nwere ngwọta. A na-eji ude e ji etegbu nje nakwa ncha e mere maka ịsa isi bu nje asagbu ya. Ụfọdụ na-aṅụkwara ya ọgwụ. Gbaa mbọ hụ na gị na onye nwere ọkpụ isi oringo ekeghi otu mbọ isi, okpu, ejighi otu akwa ehicha ahụ nakwa edinaghị n'otu akwa. 5) Isi nkwọcha (Alopecia) Alopecia bụ aha a na-akpọkarị ndapụ ntutu n'ụzọ dị iche iche. Mana ozi ọma so ya bụ na o nwere ngwọta ụfọdụ oge, ma i lekọta ntutu gị ọfụma. Gịnị na-ebute ya? Ụfọdụ oge ọrịa na-ebute mfopu ntutu, ndọkasị ahụ na-ebutekwa ya. Ụfọdụ oge onye na-anata ọgwụgwọ maka ọrịa kansa na-enwekwa ọrịa alopecia a; ọzọ bụkwa na oke ibu na-emekwa ka ntutu ndị mmadụ na-adapụsị, ọzọ bụkwa onye iron ezughi oke n'ime ahụ ya. Etu e si agwọ ya A na-eji Finasteride na minoxidil agwọ isi nkwọcha n'ụmụnwoke, na-eji minoxidil agwọ ya n'ụmụnwaanyị (Finasteride adịghị nwaanyị mma n'ahụ) A na-ejikwa nke Bekee kpọrọ Immunotherapy (bụ ite kemịkal n'elu ebe kwọchara akwọcha) agwọ ya, nakwa nke a kpọrọ steroid (ma ude ya ma ntụtụ ya). Ụfọdụ na-eme nke Bekee kpọrọ ""hair transplant"" nke bụ iweta ntutu ọzọ rụnye ya n'isi gị. 6) Igwu (Lice) A na-ahụkarị igwu n'isi ụmụaka n'ihi etu ha na-esi egwukọta egwu. Ọ bụghị inyi na-ebute ya, kama ọ na-efe efe. Ọ na-akọ ezigbo ọkọ, na-adị ka enwere ihe na-agagharị gị na ntutu, mana a na-eji mbọ nwere eze kịrịkịrị achọta ya na ntutu mmadụ. Etu e si agwọ ya Ncha ọbụla e ji asa isi ga-agwọnwu ya. Bọọ isi gị nwayọ nwayọ oge mmiri ka dị n ya, ruo mgbe ị bọpụchara ya. Mmanụ osisi tii, mmanụ eucalyptus nakwa nke lavenda na-enyekwa aka. Ụfọdụ ọrịa ndị ọzọ nwere ike iri gị nri n'isi maọbụ mee ka ntutu gị na-adapụ gụnyere ndị: Ụgwọ bụ nke Bekee kpọrọ Eczema, Impetigo, Folluculitis nakwa Isi nkwọcha ụmụnwaanyị bụ nke Bekee kpọrọ ""Female pattern baldness"". Otu ihe e nwere iji elekọta ụfọdụ n'ime ọrịa ndị a bụ ihe Bekee kpọrọ ""Emollients"". Gịnị ka ọ bụ? Emollients bụ ihe nwere dịka ude mmiri a na-etekwasị n'ahụ iji wetulata mmefu mmiri dị n'ahụ mmadụ, ma jirikwa ya na-ekpuchite nakwa echekwa anụ ahụ. A na-ejikarị ya elekọta ahụ na-ekpekasị ekpekasị maọbụ ahụ mmiri kọrọ. Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-53197101 +sports Foto Diego Maradona: Nlereanya maka ndụ dike a bụ ọkaibe na bọọlụ Diego Armando Maradona, onye e ji ịgba bọọlụ mara, nwụrụ n'ụbọchị Wenezde, Nọvemba 25, 2020. Ọ gbara afọ iri isii. https://www.bbc.com/igbo/afirika-55074817 +entertainment Angela Nwosu's Mother: Di m si mgbachi ebubo ndị mgbu nkịtị """Ọ bụghị taa ka ndị mmadụ malitere bowe m ebụbọ ụgha n'elu soshal midia."" ""Ihe ndị a na-adị m mma makana ọ na-enyekwu m ọtụtụ ndị nso nso nakwa nnukwu ego."" Okwu ndị a si n'ọnụ Angela Nwosu e ji 'Digital Ogbanje' mara na soshal midia. O kwukwara na ọ bụ kamgbe afọ 2016 ka ndị mmadụ bowere ya ọtụtụ ebubo ọ na-ekweghị asa, makana dị ya bụ Austin Soundmind ekweghị ka ọ saa ebụbọ ndị ahụ. Ebubo ndị e boro Angela Nwosu na nso nso a n'elụ soshal midia gụnyere ihe ndị a: Gezie ya ntị ka ị nụ ịgba o tiri n'ọnụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58242348 +politics Anambra election 2021: Ihe ị kwesịrị ịma maka mmadụ 18 na-azọ oche gọvanọ Anambra steeti Dịka ndị mmadụ na-akwado ime ntuliaka e ji ahọpụta onye ga-achị Anambra steeti afọ anọ ọzọ na-abịa, lee ihe ị kwesịrị ịma maka onye ahụ. N'ime mmadụ 18 anyị ga-akọwa ndị ha bụ n'akụkọ a, otu onye ga-azọtarịrị ya bụ oche gọvanọ. Onye ka ọ ga-abụ? https://www.bbc.com/igbo/afirika-58895212 +health Penis Enlargment: Ọgwụ maọbụ ude o na-eme ka amụ nwoke buwanye ibu maọbụ towanye ogologo? "Nnyocha gosiri na otu ihe ka eche ụmụnwoke uche, ọ kachasị n'okwu gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị, bụ ogologo amụ ha. Nke a mere na ọtụtụ ụmụokorobịa na-aṅụ ọgwụ dị icheiche, na-emekwa ihe ọbụla a sị ha mee iji mee ka amụ ha towanye ogologo. N'ụzọ dị otu a, ọtụtụ aṅụọla ọgwụ ha amaghị isiya na ọdụ ya, ebe ndị ọzọ na-azụ ude nakwa ihe ndị ọzọ. I lee anya na soshal midia, ị ga-ahụ ọtụtụ ozi dị icheiche na-akwalite ọgwụ, ude, maọbụ akụrụngwa dị icheiche nke ndị na-ere ya kwere nkwa na ọ na-eme ka amụ nwoke tokwuo ogo. Kedụ ihe mere ogogo amụ jiri bụụru ụmụnwoke oke ihe? Ọtụtụ na-eche na ọ bụ etu amụ ha si too ogologo ga-egosi etu ha ga-esi kpaa ike n'ime ụlọ mgbe ha na nwunye ha nọ. Ụfọdụ na-echekwa na ọ bụ ihe gosiri na nwoke bụ dimkpa. Ndị ọzọ ka ọ na-ajalite mmụọ ha maka onwe ha. Nke a bụ isi ihe ọtụtụ ụmụnwoke ji achọ enyemaka ịhụ na amụ ha dị mma ile anya. Ịṅụ ọgwụ maọbụ ite ude ọ na-eme ka amụ mmadụ towanye ogologo? Mgbe Dọkịta Godwin Ezegbe, bụ dibia bekee na-arụ ọrụ na Legọs, Naịjirịa, na BBC kpalitere okwu a, o kwuru na nnyocha gosiri na ọtụtụ ọgwụ nke e kwuru na ha na-eme ka amụ nwoke towanye ogologo anaghị arụ ọrụ. ""Ọtụtụ ndị na-arụpụta ọgwụ ndị a abụghị ụlọ mmepụta ọgwụ a ma ama,"" Ezegbe kwuru. ""Ọtụtụ ụmụ nwoke ṅụrụ ọgwụ ndị a kwuru na o nweghị ihe ọbụla dị iche ha chọpụtara n'ahụ ha."" Ezegbe kwuru na o nweghị ụlọọrụ a ma ama na-arụpụta ọgwụ, nke ya onwe ya ma, na-arụpụta ọgwụ maọbụ ude na-eme ka amụ towanye ogologo. Ogo amụ nwoke tozuru etozu Dịka ụlọọrụ ""National Health Service"" nke mba UK si kọwaa, amụ mmadụ niile ahaghị nhaanya n'ihi na ""etu ndị mmadụ si eto dị icheiche"". Mana amụ ọtụtụ ụmụnwoke na-adị ihe dịka sentimita itoolu (9cm) maọbụ inch atọ na ụma ise (3.57 inches), ma ọ bụrụ na o kwụghị ọtọ. Ogologo amụ kwụ ọtọ na-adị ihe dịka sentimita iri na atọ ruo iri na asatọ (13cm-18cm), maọbụ inch ise ruo asaa (5-7 inches). Ụfọdụ ka amụ ha na-echewe ihu n'elu ma ọ kwụrụ ọtọ, ụfọdụ ka nke ha na-akpọdo isi n'ala. Ụfọdụ nwere ike gbagọọ agbagọ obere n'aka nri maọbụ aka ekpe. Ihe ndị a dabeere n'etu ahụ mmadụ si dị dịka ọ na-etolite. Site n'afọ iri na otu ruo afọ iri na asatọ bụ oge amụ nwoke na mkpụrụ amụ ji eto ma gbasie ike nke ọma. Mana mmadụ gafee afọ 21, amụ ya ga-akwụsị ito. ""Mmadụ enweghị ike ime ka amụ ya towanye ogologo site n'ịṅụ ọgwụ, maọbụ mgbatị ahụ,"" ndị NHS depụtara. Eziokwu gbasara ịgbatị amụ nwoke Dọkịta Sheldon Marks bụ ọkacha mara n'ahụike ụmụnwoke, ọ na-edekwa akụkọ n'ọbaozi webmd.com, bụrụkwa onye nkuzi na Mahadum Arizona na mba Amerịka. O kwuru na n'ime ọtụtụ afọ ọ rụrụla ọrụ dịka ọka mmụta, ọ chọpụtara ihe ndị a: Enyemaka maka nwoke amụ ya perempe O nweghị ọtụtụ ihe mmadụ nwere ike ime iji gbanwee ole amụ ya ha, kama ihe dị mkpa bụ itinyere ụwa obi ọma ma mụta etu ị ga-esi were ihe i nwere nweta ihe ị na-achọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60109854 +politics Ugo eberela na mgbagbu n'Osun maka ntuliaka ọkwa gọvanọ "Dika ntuliaka ọkwa  Govanọ Osun steeti fọrọ naanị otu abalị, ebe niile na-ede jim jim na steeti ahụ dịka egbe na ugo, oke na ngwere na-eme nkwado ikpeazụ  ịkọ n'ubi onye a bịara ọrụ na nke ya. Na Satode, abalị 16 nke ọnwa Julaị afọ 2022, ndị Osun steeti ga-eme ntuliaka ịhọrọ onye ga-abụ gọvanọ ha n'ime pati 15 Inec kwuru tozuru ịzọ ọkwa ahụ. Dịka ngalaba ahụ na-ahazi ntuliaka si kwuo, mmadụ 1,955,657 debanyere aha ha n'akwụkwọ maka ntuliaka na steeti ahụ ga-atụ vootu n'ọgbọ atụm vootu  3,763 dị na steeti ahụ ụbọchị ahụ. Onye ntaakụkọ BBC Igbo gagharịrị n' Osogbo ụbọchị Tozde kwuru na ahịa na okporoụzọ nile na-ekwo ka ebe a na-eme agụgụ  dịka ndị mmadụ na-azụ ahịa ihe ha ga-eri ụbochi Satode nakwa ụbọchị ụka. Nke a bụ maka na ndị uweojii mara ọkwa na agaghị enwe mkpagharị malite n'etiti abali Fraide ruo elekere isii nke mgbede Satode  bụ ụbọchi ntuliaka. Dịka Inec si kwuo, pati 15 ga-azọ ọkwa Gọvanọ Osun steeti na ntuliaka Satode. Ha gụnyere: Gboyega Oyetola nke APC, bụ gọvanọ nọ n'ọchịchị ugbua ma na-azọ ọkwa nke ugboroabụọ ya;  Ademola Adeleke nke PDP (nwanne nna otiegwu David Adeleke a ma ama dịka Davido; Yusuf Sulaimon Lasun  nke Labour Party; Akinbade Ogunbiyi nke Accord Party; Peter Segun Awojide nke AAC; Kehinde Munirudeen Atanda nke ADP na Awoyemi Oluwatayo Lukuman  nke APM. The ọzọ bụ Adebayo Adeolu Elisha nke APP; Rasaq Oyelami Saliu nke NNPP; Samuel Adetona Abede nke NRM; Busuyi Ayowole nke PRP; Akinrinola Oyegoke Omigbodun nke SDP; Ademola Bayonle Adeseye nke YPP na John Olufemi Adesuyi nke ZLP. N' agbanyeghị na ọ bụ mmadụ 15 na-asọ mpi a, otu onye ntaakụkọ achọghị ka a kpọ aha ya n'ihi na o nwere ike itinye ya na nsogbu, gwara BBC Igbo na ya bụ ntuliaka bụ ọgụ dị n'etiti naanị mmadụ abụọ: Oyetola nke APC na Adeleke nke PDP. Pati abụo a - APC na PDP - mere achụmnta vootu pụrụ ọkụ iji gbaa mbọ ikpeazụ ịdọta ndị ga-atụrụ ha vootu na ntuliaka a. Mgbe onye ntaakkụọ anyị kpagharịrị n'Osogbo, isi obodo Osun steeti, ọ chọpụtara na naanị akwụkwọ mgbasaozi achụm nta vootu, nke Bekee kpọrọ 'posters' na 'billboard' nke  gọvanọ na-achị steeti ahụ bụ Oyetola, bụ ihe a hụrụ n'okporoụzọ a ma ama na steeti ahụ. A hụghị nke ndị  pati ọzọ  na-anọghi na gọọmentị karịa n'ụlọọrụ pati ha. Otu onye ntaakụkọ bi n'Osogbo achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị agboro mebichara akwụkwọ mgbasaozi achụmnta vootu ndị pati ndị ọzọ. Ndị ọrụ Inec, ndị ọrụ nchekwa, ndị na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye, ndị akaebe na ndị ntaakụkọ karịkwara akarị n'Osun steeti ugbua. Iji kọwa ka ha si kwado, Inec na ndị uweojii kwuru na ha ji amụma jiri mmiri, nke onye chọro, e nye ya. Onyeisi Inec na Osun State bụ Ọkammuta Ganiyu Raji gbaara BBC Igbo ama ụbọchi Tọzde na ha adịla njikere ma kesaa akụrụngwa a ga-eji mee ntuliaka. Raji kwuru na Inec ga-enyefe ndị ọbụla zụrụ vootu maọbụ megide iwu ntuliaka n'aka ndị uweojii. O kwukwara na Inec agbala mbọ ifachisi ebe mmiri siri banye opi ụgbọguru oge ntuliaka gọvanọ steeti ahụ n'afọ 2018  bụ nke akapịghị ọnụ  Bekee kpọrọ ""inconclusive"". N'otu aka ahụ, Osote Onyeisi uweojii nke mpaghara South West, bụ DIG Johnson Kokumo kwụkwara na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa jikọrọ aka ị hụ na udo chiri n'oge ntuliaka. O kwuru na ndị ọrụ ya ga-ewepụtara ndị omekome ga-achọ ibute ọgbaghara na oge ntuliaka anya. N'otu aka ahụ ndị Igbo bi n'Osun steeti kwuru na ha agaghị anọ na mmiri, ncha a na-aba ha anya. Onyeisi Ohaneze Ndigbo na steeti ahụ bụ Pst John Dike gwara BBC Igbo na ndi ịgbo nile rurula afọ 18 dị njikere ịpụta n'igwe tụọ vootu ụbọchị Satode. Dịka Dike siri kwuo, ihe Igbo na-atụ anya n'aka onye ga-abanye n'ọkwa gọvanọ bụ nkwado azumahịa nakwa inye ha oke dịịrị ha dịka ụmụ amaala, hapụ ịkpachapụ ka n'akụkụ." https://www.bbc.com/igbo/articles/crg7gdr195vo +politics Nigeria Election 2019: PDP na APC na-ebo onwe ha ebubo maka ntuliaka adọtịrị Ngalaba na-achịkọta ihe gbasara ntuliaka na Najirịa bụ Inec adọtịala ụbọchị ekwesiri ịme ntuliaka ọkwa onyeisiala, nke ndị ụlọomeiwu nakwa nke ndị ọkwa gọvanọ. Ha kwuru na nke a mere n'ihi na ha akwadoteghi ọ kachasị n'ikesa akaụrụngwaọrụ nakwa ịhazi ihe niile dị na ntuliaka kwesiri ịme taa. PDP na APC na-ebo onwe ha ebubo maka ndọtị aka ngalaba na-ahụ maka ntụliaka bụ Inec mere ntụliaka ọkwa Onyeisiala nakwa nke ndị omeiwu nke etiti na steeti dị iche ịchị. APC sị na ọ bụ nkata Inec na PDP kpara, ebe PDP gbụkwa otu asọ ahụ n'ọnụ. Festus Keyamo nke otu APC sị na ọ bụ makana PDP nọ n'ụzọ ịda na ntuliaka mere ha jiri mee ka Inec dọtịa emume a aka. Uche Secondus bụ onyeisi otu pati PDP kwuru dịka ọ bụ ya na Keyamo dekọtara akwụkwọ mgbasa ozi ebe ọ sịkwa na ọ bụ APC na Inec kụkọrọ mkpụrụ a furu ugbua. Onye na-azọ ọchịchị n'okpuru pati PDP bụ Atiku Abubakar tinyekwara ọnụ n'atụmatụ ndọtị aka a emere ntụliaka a. Atiku sị ndị na-akwado ya ka ha enwela iwe maka ihe mere. Ọ sikwa ha pụta n'uju bịa tụnye aka n'ụbọchị 23 nke Febrụwarị na ụbọchị 9 nke Maachị. Cheta na ọtụtụ mmadụ anọziela maka ntụliaka. Tosin Olugbenga na-akpọ NYSC oku ka ha tinye ọnụ n'okwu a Bashir Ahmad kwuru na ihe INEC mere adịghịrị ụmụ Naijirịa mma https://www.bbc.com/igbo/afirika-47242611 +entertainment Tekno Agege: 'Anyị ga-ezi Tekno ihe ọkụ ji ntị oke eme' - NCAC "Ngalaba National Council of Arts and Culture (NCAC) ọrụ ha gụnyere ikwalite egwu na Naịjirịa eforola ntụntụ taa ma kwuo na ha ga-eji Tekno mara ndị oti egwu ọzọ chọrọ ikpa agwa ezeghiezi atụ. Onyeisi NCAC bụ Olusegun Runsewe kwuputara nke a maka ihe onyonyo gosiri Tekno na ụmụnwaanyị yi mbeleukwu na-agba egwu n'ime ụgbọala n'okporo ụzọ Lekki dị na Legọs steeti. Maazị Runsewe kpọrọ ihe Tekno mere 'ihe megidere nchekwa obodo"" O na-akọwakwa sị ""ịgba ọtọ abughị omenala anyị nke mere na anyị agaghi anabata ya ma ọlị"". Runsewe sị ka gọọmentị chọpụta ndi niile nwere ebe a na-agba ọtọ agba egwu ka enwee ike ijide ndị na akwado ha ma gbaa ha ikpe. Cheta na ihe onyonyo wuru na soshal midia na-egosi ụmụnwaanyị yi bante agba egwu n'ime ụgbọala. Tekno mechara kwuo na ọ bu ya na ụmụnwaanyị ahụ so, ma wepụtakwa ihe nkiri egwu ya ha na-eme mgbe ahụ. Ọ bụ ndị na-agafe n'ụzọ sere ya bu ihe onyonyo ma tinye ha soshal midia. Runsewe sị na ọ bụ ebele ka emere Tekno maka ahụ adịghị ya mma. Na-ikwu na Tekno megidere usoro ejiri hapụ ha, ọ sị: "" Anyi ga-eji ya gosi ndị ọzọ ihe ọkụ ji nti oke eme n'ihi na gọọmenti a agaghị anabata mpụ na agwa rere ure. Ihe bụ ihe gọọmentị kwesiri ịkwụsịike na ya."" Ọ bu n'ụbọchị atọ nke ọnwa Ọgọstụ 2019, ka ndị mmadụ hụrụ ụgbọala bu Tekno onye ezigbo aha ya bụ Augustine Kelechi na ụmụnwaanyị na-eyichighi ahụ na-agba egwu n'okporoụzọ Lekki, Legọs steeti. Eboro ya ebubo ikwalite ọgbọ ebe a na agbaọtọ agba egwu, kama Tekno kwuru sị na ọ bụ ọrụ ka ya na ndị otu ya n'arụ. Tekno na onwe ya rịọrọ mgbaghara n'igwe Instagram ya ma kwuo na ọ bụghị mgbasaozi maka ebe ụmụnwaanyị na-agba ọtọ agba oringo ka ha na-eme. @Matilda_Duncan onye mgbasa ozi nke Redio jụrụ ""kedụ ebe mkpa obodo anyị dị, kedụ ebe Hamisu Wadume nọ, Leah ọnwụrụ anwụ"", dgz. Onye oti egwu Peter Okoye mara njakịrị sị "" I bụ nsogbu megide nchekwa Naịjirịa. Dika fufu na Garri kwuru (FG)...ngwa, anyị chọro anụ ewu"". @Oluomoofderby kwuru na kama gọomenti etiti ka amata ndị gburu ndị uweojii atọ ha na achụharị Tekno. Onyekachi Okorie sị na okwu a enweghị ịsi, Tekno bụrụ nsogbu na nchekwa Naịjiria keduzie maka ndị ntọrị, ndị ohi, Nde ọchịehi na Boka Haram. Akụkọ ka na-abịa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49316902 +health Vaginal dryness: Ihe asaa nwaanyị kwesiri ịma maka ọtụ ya ịgba mmiri "Ọ na-abụ ihe ịtụ n'anya maọbụrụ na ọtụ nwaanyị agbaghị mmiri mgbe nwoke kpatụru ya aka. Ya bụ mmiri Bekee kpọrọ 'estrogen' na-arịtụ elu iji hụ na aramara gara siriri-werere ma mee ka di na nwaanyị gwọrịa ndụ. Mana oge ụfọdụ, ahụ nwoke nwereike ị dị njikere mana ahụ nwaanyị akwadobeghị maka ahụ ya kpọrọ nkụ nke nwereike ibute ịda mba n'aramara. Dịka dọkịta ahụike ụmụnwaanyị bụ Dkta Jospeh Akinde siri kọwaa, ihe ndị nwere ike ibute ọtụ nwaanyị ịkpọ nkụ gụnyere: Ọrịa, maọbụ ọgwụ e ji agwọ ụfọdụ ọrịa; obi erughị ala; obi adịghị mma, ike ọgwụgwụ, enweghị 'ovulation' wdg. 1. Ọrịa, maọbụ ọgwụ e ji agwọ ụfọdụ ọrịa Dkta Akinde bụ onye nwe ụlọọgwụ Livingspring Hospital, Ejigbo ,Lagọs, kwuru na o nwere ike o nwee ọrịa metụtara ọtụ ya dịka ọrịa a na-ebute na mmekọrịta nwoke na nwaanyị nke Bekee kpọrọ 'sexually transmitted infections'. O kwukwara na ịṅụ ụfọdụ ọgwụ dịka ọgwụ e ji agwọ ọrịa isi maọbụ ọgwụ e ji agwọ kansa maọbụ 'fibrọd' nwere ike ime ahụnwaanyị kpọọ nkụ. 2. O nwere ihe ike ọ gabigara? Nwaanyị e dinara n'ike maọbụ nke e biri ugwu nwere ike inwe nsogbu ọtụ ịkpọ nkụ oge aramara. Dr Akinde kọwara sị, ""Ọ bụrụ o nwere ihe ike ọ gabigara dịka onye e dinara n'ike maọbụ nwaanyị e biri ugwu, o nwere ike ime ka ọtụ ghara ị na-ede mmiri oge mmekọrịta."" 3. Obi adịghị mma ""Obi nwere ike ọdịghị nwaanyị mma nke na ọ chọghị mmekọ mana o kwenyere ka ya na di ya meekọ n'ihi na ọ bụ ọrụ dịị ya dịka nwaanyị nọ na di"" 3. Ike Ọgwụgwọ N'etu ike ọgwụgwụ si akpata ya, Dkta Akinde sị, ""O nwere ike gwụrụ ya, o si ọrụ lọta , ọ nọla na kpachikpachi okporoụzọ ọtụtụ awa ezuola ime ka mmụọ aramara agaghị adị ya n'ahụ."" 4. Enweghị 'Ovulation' Ovulation bụ oge age nwaanyị na esi na akpa agwa nwaanyị bụta maka ịnata uzi nke nwoke nke na-eme abalị iri na-anọ tupu nwaanyị ahụ nsọ ya. Mana oge ụfọdụ ụfọdụ ụmụnwaanyị anaghị ahụ 'ovulation ha nke Dta Akinde kwuru nwere ike ime ka ọtụ ka kpọọ nkụ oge mmekọrịta. Ọrịa dịka ���rịa 'polycystic ovary syndrome' (PCOS) nwere ike ime nwaanyị ka ọ ghara inwe 'ovulation'. Websait na-ekwu maka okwu ahụike bụ Webmd kọwara na nwaanyị ịba'menopause nwere ike ibute ahụnwaanyị ịkpọnkụ dịka mmiriahụ nwaanyị na-agbda na nwaanyị kawa nka. ""Ọtụ nwaanyị ịkpọ nkụ so na njirimara 'menopaụse- ihe ruru otu n'ime ụmụnwaanyị na-agabiga mgbanwe"" nke na-aga n'ihu na ha ma afọ ha na-agbali. Ndị ọkachamara na-ekwu n'oge ụfọdụ, ọtụtụ ụmụnwoke anaghị akpa ṅwaanyị ha aka ọfụma tupu aramara n'ihi na ọ na-ahụha ahụ maọbụ ha amaghị akụkụ ahụ nwaanyị ha na-akpalite ha. Nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ maọbụ nke na-enye nwa ara nwekwara ike inwe nsogbu ahụnwwanyị ya ịkpọ nkụ oge arama. Inye nwa ara na-adị nwaanyị n-ahụ dịka onye barala 'menopause' . Nke a bụ n'ihi na mmiri ahụ na-eme ka mmiri ara gbaa nwaanyị na-egbochi mmepụta 'estrogen'. Dịka ndị ọkachamara n'okwu ahụike ụmụnwaanyị siri kwuo, ọ dị mkpa inyocha ihe butere nsogbu nwaanyị tupu a mata ụzọ aga esi egbo ya. "" Ọ bụrụ na ọ bụ ọrịa ka o butere, ọ dị mkpa ịgwọ ya bụ ọrịa,"" ""Ọ bụrụ ihe ike mere ya kpatara nke a, ọ dị mkpa ịhụ ndị na-ahụ maka ahụike uche(psychologist) maka nleta"" ""Ọ bụrụ na onye e biri ugwu, ọ o nweghị ihe ọ ga-eme karịa ịzụụ mmiri ahụ Bekee kpọrọ 'lubricant' oge ọ chọọ ime aramara."" O kwuru na nwaanyị e biri ugwu nwekwara ike iji 'lubricant' gboo ya bụ ọgụ. Ọzọ, ndị ọkachamara na-adụ ndị di ọdụ ka ha tinye tụ oge oge ha na nwaanyị ha na-egwu egwu tupu ararama iji nye ohere ka ahụnwaanyị dee mmiri n'ihi na onye mara sụọ, ọ sụọ n'ikwe." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59528144 +entertainment Emume ọkazị Emii: Ihe mere obodo a jiri akwanyere akwụkwọ nrị a ugwu Ọkazi bụ akwụkwọ nrị eji ete ofe, ma jikwara ya agwọ ngwọ ngwọ na ihe ndị ọzọ. Obodo Emii dị n'Imo steeeti nwere oriri ha na-eri maka ọkazị. Ka ha siri kụọ akụkọ ya, ha si na ọ bu nna mụrụ ha aha ya bụ Emii choputara akwụkwọ nrị a ma rie ya hu na ọ dị ya mma na-ahụ. N'oge emume ọkazị a, ndị Emii adịghị ese okwu maọbu lụọ ọgu. Ha sị na oge emume a, onye ọbụla nwereike ga rie nri ebe ọbụla ọ chọrọ. Ọzọkwa bu na ọ bụ naanị ọkazi ka a na-esi n'obodo ahu n'oge emume ọkazị. https://www.bbc.com/igbo/media-51222237 +health Lassa Fever outbreak: Lekwa mkpamkpa Iba Lasa na-akpa n'Umuahịa nakwa ihe iri imaghị maka ọrịa a "Ndị Abia ụjọ atụla ụnụ makana ministri na-ahụ maka ahụike na-egbochi ọrịa Iba bataralanụ na steeti ahụ ifesasi karịa etu ọ dị ugbua. Ọ bụ dọkịta Joe Osuji bụ kọmishọna ahụike Abia steeti na-agwa ndị Abia nke a. Osuji kwuru na ya ndị otu ya achọputala otu onye ọrịa ahụ ji ugbua ma na-enye ya ọgwụgwụ. Ọ kwuru na otu gbata gbata anọrọla chịm ruo ụbọchị iri abụọ n'otu izaa ndị mmadụ nwere ike idanyere ọrịa ahụ. Ọ rịọla ka ndị Abia chụpụ oke , kwụọ aka mgbe niile, dowe gburugburu ha ọcha, kwụsị ịṅụ ""garri"", sie nri ha n'ọkụ ọfụma tupu ha erie. O kwukwara ka ha gaa n'ụlọ ọgwụ nọ ha nso ma ya bụ ọrịa banye n'ahụ ha. Lassa Fever: Ihe iri ị maghị maka ọrịa ọjọọ a Ọkacharamara n'okwu ahụike ọha bụ Dr Chuks Agunwa nke UNTH kọwara na ịba Lasa na-egbu mmadụ ma onweghị nleta n'oge. Dokita ahụike ọha bụ Dr Agunwa akọwala na isi jọrọ ọrịa Lasa njo nke ukwu. "" Ọ na-egbu mmadụ rinne ọ banye gị n'ahụ ọ na-enye nnukwu nsogbu. Ọ na-ahịa ahụ ịgwọta mana "" Mana, ""onye nwere lasa gaa n'ụlọọgwu n'oge, a ga agwọtali ya."" Ụzọ esi enweta ya Dọkịta Agunwa kọwara na ọ dị ụzọ abụọ e si ebutekarị ịba Lasa: Kedụ ka ị ga-esi ma na i nwere ọrịa lasa? Ọ naghị ewe anya ị mata onye nwere ọrịa Lasa n'ihi na njirimara ya na-eyi nke ịba ndị ọzọ dịka taifod, ịba wdgz. Mana Agunwa dụrụ ọdụ ka ị gaa ụlọọgwụ maka nyocha ahụ ma ị hụ ihe ndị na-atụ aka na ị nwere ọrịa a dịka: 3 Mmadụ ịsị na oke arụ na-eme ya ( temperature karịa 38 degrees) 4. O na-eji isiọwụwa ebido 5. Onye ahụ na-agbọ agbọ 6. Ọbara si na mamiri, nsị nakwa na anya onye ahụ na-apụta (nke a na-egosi na ọrịa ahụ akarịala otu izuụka, na ọrịa ahụ eriela ahụ onye ahụ) Lasa na Ebola enwere nyiri? Lasa na Ebola nọ n'otu ezinaụlọ, ha abụọ bụ 'vịrọs' 7.Etu ha si egbu mmadụ yiri 8.Mana Ebola ka Lasa njo 10. Gaa ụlọọgwụ ozigbo i nwere njirimara a gụpụtara na 3,4,5 maọbụ 6." https://www.bbc.com/igbo/afirika-46970094 +entertainment Anita Joseph: 'Ụfọdụ ụmụnwaanyị Nollywood ka enwe ego maka 'nnukwu mpa' nọ ha n'akukụ' Anita Joseph bụ onye na-eme ihe nkiri na Nollywood ekwuola na ihe na-amasị ya bụ ịgbachitere ndị a na-emegbu emegbu . Ọ kọwara ihe mere ụmụnwaanyị Nollywood ji aka enwe ego karịa ụmụnwoke ha. Gere ya n'ihe nkiri a. Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho, Nnamdi Kelechi Agbanelo https://www.bbc.com/igbo/afirika-48271430 +entertainment Christmas seasons greetings: Etu ndị a ma ama si agba ekeresimesi nke 2021 Ndị a ma ama kwadoro akwado maka emume ekeresimesi nke afọ 2021 a. Lee ihe BBC Igbo hụrụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-59790784 +health Coronavirus: Ihe o ji raa ahụ ịkwụsị ndị mmadụ imetu aka n'ihu ya "Otu n'ime ihe dị iche anyị na ụmụanụ bụ na mmadụ na-emetukarị aka n'ihu na-amaghị ama. Ọ bụ agwa a na-enyekarị ọrịa Covid 19 aka agbasa. Maka gịnị ka anyị ji emekarị ya ma kedụ otu anyị ga-esị kwụsị ya? Gịnị ka anyị ji eme ya? Ọ dịka ọ bụ ebum pụtaụwa na mmadụ na ụfọdụ anụmanụ dịka adaka na-emetụkarị aka n'ihu ha. Ọkammụta na Saịkọlọji bụ Dacher Keltner nke mahadum UC Berkeley for America sị na imetu aka n'ihu na-eme ka mmadụ nwete onwe ya ma mgbe ụfọdụ anyị na-eme ya ma anyị hụ onye anyị huru na anya. Ndị ọkammụta ọzọ gbasara agwa mmadụ sị na anyị na-eme ya mgbe ụfọdụ ka anyị were chịkọnata obi anyị maọbụ dowe obi anyị otu ebe. Mana nsogbu bụ na ọ bụ ya bụ agwa na-ebusa nje n'ahụ mmadụ. Iji maa atụ, ọrịa Covid 19 na-esi na mmiri ahụ mmadụ dịka asọmmiri abanye ndị ọzọ n'imi maọbụ n'ọnụ. Mmadụ nwere ike ibute nje site n'imetu ihe ya bụ nje dị aka bụ ebe ọ nwere ike ịnọ rụọ abalị itoolu. Ọ bụ ogologo ndụ a ya bụ nje na adị, ya na ka o sị esi n'aka mmadụ meturu n'ihu banye na ahụ mmadụ mere ya bụ nje ji dị ajọ njọ. Ọkammụta ndị Mahadum Leeds bụ Stephen Griffin na-akọwa na iji akwanza bekee kpọrọ ""face mask"" kpuchie ihu nwere ike ime ka mmadụ metudebe aka n'ihu karịa ịza ikuku nke ha che na o bu nje ọrịa ahụ. Ọkammụta n'ihe gbara agwa ndi mmadụ na Mahadum Columbia bụ Michael Hallsworth sị na ịkwusị ndị mmadụ imetu aka n'ihu ha hiara ahụ. Ọ sị na ọ ka mfe ịsị ndị mmadụ kwọwa aka karịa ịsị ha emetuzila aka n'ihu. Ọkammụta a sị ka anyị chọwa ihe mere mmadụ jikarị emetu aka n'ihu iji mata ka anyị ga-esi kwọọ ya bụ ọrịa. ""Ọ mara atụ sị na onye ọkọ na-akọ n'ihu nwere ike iji azụ aka kọo ya karịa iji mbọ"". Ọ sịkwa na ""ọ bụghị na nke ahụ dị mma kama na ọ ka mma"". Ọ sịkwa ""ndị na-akọkarị ọkọ n'anya nwere ike iyi ugegbe anya, maọbụ tukwuruala n'elụ aka ha ị iji gbalahụ ọnwụnwa ya"". Ị nwere ike iji ihe ndị ọzọ ị ga-eji emegharị aka dịka nke akpọrọ ""stress ball"" na Bekee bụ nke ị ga-eji ọgwụ eji egbu nje hichaa nke ọma. Mana a eyikwala afe aka Bekee kpọrọ ""glove"" maka ọ bụrụ na ị naghị agbawe ya ka o kwesiri ma yiri ya na-akwọ aka gị, nje nwere ike ị banye na ya. Ụzọ kacha mma iji gbochie ya bụ ọrịa bụ ịkwọcha aka nke ọma. Dịka onyeisi na WHO bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus kwuru ""e chela ka e wepụta ọgwụ mgbochi ọrịa a, ị mara ihe ị ga-eme iji nyere onwe gị na ndị ọzọ ka taa, bido ozugbo""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51785631 +health China Coronavirus: Anyị ebidola inyocha ndị njem - FAAN "Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naijiria bụ 'Federal Airports Authority of Nigeria' (FAAN) arịọla ụmụ Naijiria na-eme njem ka ha rube isi ma nye ohere maka inyocha ha ahụ. Nke a na-eme dịka ajọ ọrịa Coronarvirus dapụtara na China, gbuo mmadụ iri abụọ na ise ma jituo ihe karịrị mmadụ 300. Ọrịa ahụ efesakwaala ruo mba Japan,Thailand, Singapore nakwa South Korea. N'akwụkwọ ozi ya, ọnụ na-ekwuru FAAN bụ Henrietta Yakubu kwuru na ụlọrụ ahụ na ngalaba na-ahụ maka ahụike agbaala mbọ iji hụ na ngwa ọrụ dị mkpa iji gbochie ọrịa ahụ zuru oke n'ọdọụgbọelu. O kwuru sị: ""Ngwa ọrụ nile na ndị ọrụ ndị nyere aka na ịkwụsị ọrịa ebola n'afọ 2014 ka dịkwa n'ọdọụgbọelụ anyị."" Ka ọ dị ugbua, ọrịa coronavirụs emeela ka e mechie obodo mepere emepe atọ na China; Wuhan, Ezhou na Huanggang . Obodo Beijing kwụsịkwara mmemme niile ha chọpuburu ime n'ihi ya bụ ọrịa. Iba Lasa aribatala n'Enugwu steeti. Onye ntaakụkọ BBC gara ụlọọgwụ Parklane ebe ndị ọrụ nọ na gbagharia dịka orịa lassa Fever gburu otu nwaanyị gbara afọ iri asaa na ise ebe ahụ. Ka ọ dị ugbua, enwetela mkpesa Lassa fever na Ondo,Abia, Delta na Kano steeti. ọrịa a egbuola dọkinta abụọ na nwaanyị dị ime na Kano, mmadụ iri na isii na Ondo steeti, otu nwoke n'Abia steeti. Ka akụkọ nje na ọrịa na-aga n'ihu, ndị mba China amachiela mbata ma ọ bụ ọpụpụ na obodo Wuhan maka nje Corona nke na-egbu ndị mmadụ ka ọrịa SARS. Nyocha na egosi na ọ bụ na Wuhan ka ya bụ nje siri bido site na-ire anụ ọhia. Mmadụ iri na asaa anwụọla ebe ihe dịka mmadụ narị ise na iri asaa bụ ya bụ ọria ma otutu ha bị na Wuhan. Mmadụ atọ anwụọla dịka ụgbọelu eji emenyu ọku dara na mba Ọstrelịa. Mmadụ atọ a bụ ndị mba Amerịka sọ na mmadụ iri ato na atọ nwurula maka ọku a bidoro gbawa kamgbe ọnwa Seputemba 2019. Dịka ọ dị ụgbụa, amabeghị ihe mere ka ya bụ ụgbọelu daa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51225156 +sports AFCON 2019: Lee 'ụmụanụmanụ' ga-achịpụ ya n'asọmpi AFCON 2019 "Ọ bụ ụmụanụmanụ, kpakpando na ndịagha ga-achịpụ ya na mba Pharoah dịka asọmpi Iko mba Afrịka nke ugboro 32 ga-ebiri ọkụ. Isi akụkọ bụ na ọtụtụ n'ime mba 24 na-azọ Iko mba Afrịka nke afọ a nwere aha e ji mara ha nke bụ aha ụmụanụmanụ. Ugbua, n'agbanyeghi na e nwere ọtụtụ ọdụm n'Afrịka ndị dịka Ọdụm nke Atlas na Ọdụm nke Teranga mana Ọdụm nke Indomitable ka bụ eze nwe ọhịa. Aha otutu abụghị naanị maka ịkpa ọchị n'egwuruegwu bọọlụ kama ọ bụ ihe dị oke mkpa n'egwuregwu bọọlụ Afrịka tinyere nmuke ndị nkwado na ịgba ha na-eti. Aha otutu nke otu egwu bọọlụ bụ oke ihe nye mba Afrịka, ọ bụghị naanị na ọ bụ ihe njirimara nye ndị nkwado ha kama ọ na-akwalite mmụọ ndị ọgba bọọlụ. Lee 'Ụmụanụmanụ' ndị a Ụmụanụmanụ pụtara ihe n'aha ọtụtụ otu egwuregwu bọọlụ tozuru oke n'AFCON nke afọ a, ọkachasị ugo. Naịjirịa - bụ ndị e ji uwe agwa ndụndụ mara mana aha otutu ha - NnukwuUgo bụ nke ka ada ụda. Aha otutu a si n'ugo dị na njirimara Naịjirịa, na mbụ ha na-aza 'Green Eagles'. Malị - aha e ji mara ha bụ Ugo ebe Tunisịa na-aza Ugo nke Carthage makana ugo bụ otu n'ime ihe gbapụtara ihe e ji mara mmepeanya ndị 'Carthage'. Chekeleke nkeUganda bụ mba ọzọ so n'AFCON 2019 nke aha otutu ha bụ nnụnụ a. Ebe mba ndị nọ na mpaghara Yurop na-azakarị aha otutu site n'agwa uwe egwuregwu bọolụ ha, ndị nke Afrịka na-aza nke ụmụanụmanụ nọ n'oke ọhịa. Site n'ọdụm ruo agwọ, agụ ruo enyi, ha niile 'gbara kasa' n'asọmpi AFCON nke afọ 2019 a. Ụmụnwoke siri ike na ndị Eze na-amasị ndị Afrịka, ya mere e ji baa ụfọdụ otu egwuregwu ndị a aha ha. A ma Ijipt dịka 'Pharaohs'; njirimara mmepụta obodo nakwa ọchịchị Eze, nke gosiri na ha bụ ""Igwe na-achị Afrịka"" maka etu ha si bụrụ ndị kacha buo Iko AFCON (ha ebuola ya ugboro asaa). Mohamed Salah bụ onye na-agbara mba ha bọọlụ bụ Ọkacha agba nke CAF na BBC nke afọ a. Ndị 'Warriors' nke mba Zimbabwega-anwa ike ha dịka ha ga-ezute ndị Eze nke Ijipt n'ime egwuregwu bụ nke e ji emepe asọmpi Iko Mba Afrịka nke afọ a. Ihe ọzọ na-ewu ewu na mpaghara Afrịka bụ ndị na-aza aha akara igwe. A ma ndị nke mba Kenya dịka 'Harambee Stars'- Harambee n'asụsụ Swahili bụ olumba ha, pụtara ""ịdọkọta ọnụ"", aha otutu na-akpọku mba ha na otu egwuregwu ha ka ha nwee otu obi. A ma otu egwuregwu ndị Ghana dịka 'Black Stars' maka agwa kpakpando dị n'ọkọlọtọ mba ha, nke bụ nke ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ kwenyere ga-eme ka ndịnotu bawanye. Ngwanụ ka asọmpi biri ọkụ. Kedụ ndị ị chọrọ ka ha merie? Họrọ ebe a: Iko Mba Afrịka 2019: Họọrọ ndị i che ga-agwọ ibe ha ka abacha" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48720259 +entertainment Igbo Musicians: Ndi Otiegwu Igbo kpọtụrụ akpọtụ na 90s rue afọ 2000 "Ihe e jiri mara ndị otiegwu Igbo na ngwụcha 80s banye 90s bụ karịrị egwu ụka. Oge a bu oge ụka agba ọhụrụ pụtarachara ma dọrọ ọtụtụ ndị mmadụ ndị na-ekwu na ha echegharịala. Ụfọdụ n'ime ha nwere onyinye ịkụ egwu malitere ịkụ egwu ụka,ebe ndị enweghị nka egwu jụrụ egwu oringo na-achọzi egwu ụka. Egwu ụka bidoro gawa ahịa nke na ọ bụrụ na otiegwu Igbo esonyeghị, ụgbọ aghara ya. Mana ngwucha 90s na mbido 2000, egwu oringo dịka 'highlife' bilitere n'ọnwụ, ebe ụmụ agba ọhụrụ bidokwaziri kụwa 'hip-pop'. Lee ụfọdụ otiegwu Igbo wuru ewu na 90s na 2000 : 1. Helen Nkume Ọ bụrụ na a mụrụ gị maọbụ na i toro na 70s, 80s na 90s, ị gaghị echefu otiegwu ụka bụ Prophetess Helen Nkume. Egwu ya bụcha egwu ụka bụ ndị redio ji akwọ aka ụtụtụ, ebe ndị ọkwọụgbọala n'ala Igbo ji ya echere ndị ha na-ebu ọjị ụtụtụ. 'Nna biko' bụ egwu arịrị na mbeku Chineke wuru ewu na 90s. Mana Ị ma onye ndu otu egwu 'Galilee Gospel Band' nke ụka Cherubim na Seraphim na-akụbụ 'egwu ụwa'? Uchenna Ikonne kọwara na Helen Nkume onye bụbu Helen Williams na-akụbu egwu 'highlife' tupu ọ lụọ di ma zagharịa aha. Ụfọdụ egwu ndị o tiri 2. Gozie Okeke Ikekwa ị maghị aha ya, mana egwu ya na nwunye ya bụ ""Akachawa"" nke wuru ewu ngwụcha 90s na-atọpu gị isi. Ọ bụghị naanị gị ka 'Akanchawa' Gozie Okeke na-akpọfe, ọ na-amasị ndị Yoroba, ndị Ugwu, ọbụladị ndị ụka Alakụba n'agbanyeghị na e ji Igbo kụọ ya. Dịka otu onye ntaakụkọ ihe gbasara egwu doro anya bụ Ngozi Emedolibe kwuru na ndịiche dị na Gozie Okeke sị na ọ na-etinye okwu otutu n'ime egwu ya dịka, 'Jesus Otibimbodombo'. Gozie Okeke, onye Nnobi, Anambara steeti kụkwara ọtụtụ egwu ndị ọzọ gụnyere 'Nne m Ọma'. Ọ zụlitere nwunye ya Njideka n'iti egwu tupu nwaada ahụ abanye ihe nkiri 'Nollywood.' Ụfọdụ egwu o tiri 3. Theresa Onuorah Theresa Onuorah bụ otiegwu a ma awa wuru ewu na 90s na agbanyeghị na otu egwu ya bụ n'ebe 1985 ka o bidoro ya. Ụmụagbọghọ na okoro toro n'ala Igbo na 90s aghaghị ịma egwu ya bụ Egwu Egedege nke a na-agba n'emume pụrụ iche dịka akwamozu, agbamakwụkwọ na mmemme ndị ọzọ n'ala Igbo nakwa ebe ọbụla ndị Igbo bi na mba na-eme emume na Naijiria. Onuorah, onye Unubi Anambara steeti bụ onye na-akwalite omenala Igbo site egwu Egedege bụ egwu ndị si na mpaghara ala Igbo ahụ na-agbakari. Ihe mere egwu Egedege nke Theresa Onuorah ji pụo iche bụ ọja a na-afụ na ya nke bụ ihe mbụ e ji ebido egwu ya niile; ejiji ya dịka ezenwaanyị, nzọ egwu ndị otu egwu ya ndị bụcha okoro na agbaghọ na-apụ anwụrụ. Theresa Onuorah na egwu Egedege ka dị ndụ mana ha naghị ewusi ugbua ka ọ dị na 90s. Ụfọdụ mmadụ ka na-akpọkwa otu egwu ya maka mmeruba ụbọchị mana ọ dịghịkwa ka ọ dị na mbụ oge e ji ịkpọ ya na mmemme ama ọgaranya ka ibe ya. Ụfọdụ egwu o tiri 4. Chika Okpala A kpọọ Chika Okpala, obi ọtụtụ mmadụ na-agbaga na ọkpaọchị a ma ama na ejije 'New Masquerade"" na-azakwa otu aha ahụ. Mana naanị ihe jịkọrọ mmadụ abụọ ahụ bụ n ha bụ ndị Anambara steeti; Chika Okpala ọkpaọchi bụ onye Nnobi, ebe Chika Okpala nke na-eti egwu bụ onye Achina. Bro. Chika Okpala bụ ihe e jiri mara ya na ndị otu egwu ya ọ kpọrọ Believers Voice bụ ndị otiegwu ụka kpọtụrụ akpọtụ na ngwụcha 80s banye 90s. Ọ bụ otu n' ime ndị na-eti egwu ' a mụnworo ọzọ' , ndị ji onyinye Chukwu nyere ha na-agbaso ozi ọma, na abụghị iji kpata ego. Njirimara egwu ya bụ na ọ na-abụkarị egwu na okwu ntụgharị uche. Ọ na-ezi ozioma nchegharị ma na-ekwugidekwa ajọ ọchịchị obodo. Egwu ya kachasị wuo bụ ""Nigeria Ụkwụ Apụọ m Ọsọ"" mana o tikwara ọtụtụ ndị ọzọ. Ụfọdu egwu o tiri 5. Charly Boy Charles Chukwuemeka Oputa, a ma dịka 'Charly Boy' bụ otiegwu a ma ama na Naijiria maka ị na-ekwupụ okwu gbasara ọganihu obodo, ikike dịrị onye na ndọrọndọrọ. Charly Boy bụ nwa nke abụọ nke ọkaikpe Ụlọikpe Kachasị nwụrụ anwụ bụ Ọkaikpe Chukwudifu Oputa, onye Ugwuta n'Imo steeti. Ọ gụrụ akwụkwọ na mba Amerịka mana ọ gbahapụrụ ya gawa iti egwu na ime ihe onyonyo(producer.) Egwu ya kachasị wuo ewu bụ nke ọ kpọrọ '1990' mana o tikwara egwu ndị ọzọ. Ọ bụ ya nwe ihe onyonyo 'Charly Boy Show' bụ obere ihe egwuregwu o ji aghọrị maọbụ maja mmadụ nakwa 'Zoom Time nke ya na Tunde Obe na-eme bụ ihe onyonyo ha ji atụnye ọnụ na ka obodo siri kwụrụ. Dịka otu onye ntaakụkọ ihe gbasara ndị egwu doro anya bụ Ngozi Emedolibe si kọwa, "" Ụdị mmadụ Charly Boy na-ada ụda karịa egwu ọ na-eti ."" Emedolibe kọwara na Charly a kpọpụtala ọtụtụ ndị o mere ka ha chakee n'iti egwu na ọrụ ikpa obi ọma. Ụfọdụ egwu o tiri 6. Tyna Onwudiwe Tyna Onwudinwe bụ nwa afọ Igbo ọzọ a ma ama n'iti egwu wuru ewu na 90s. Ndị mụrụ ya bụ Maazị Justin Onwudiwe na Patricia Wilkinson, ndị Ugwuta, Imo steeti. Tyna Onwdiwe tiwere egwu oge ọ dị na nwata oge ọ na-eso ndị otiegwu nwere aha agụ egwu. Ndị dịka Tabansi Studio na Rogers Okonkwo' n'Ọka nakwa Ọnịcha. Egwu mbụ o tiri e ji mara ya 0bụ nke ọ kpọrọ, ""Afrikan Oyibo"" bụ nke o tipụtara n'afọ 1992. Mana nke kachasị wuo ewu bụ ya kachasị wuo ""Black On Black"" Ndị maa nwa ada a na-etu, 'Afrịkan Oyibo' ga-agwa gị na o so na ndị otiegwu Igbo hụrụ ụzọ oge ọtụtụ ndị isi ha na-apụ ọkụ ugbua ka nọ n'afọ nne ha. I zute Tyna n'ụzọ mbụ, ihe ga-aba gị anya bụ ụdị isi o bu n'isi nakwa uwe ya. Ọ na-akpụ akụkụ isi ya abụọ, ma kee etiti ya eke, ebe ọ na-ejikwa ejiji azụ-anụ-ụka. Tyna, dịka enyi ahụghị na-erịghị ya bụ Charly Boy bụ onye e ji ihe ndị ọzọ ọ na-eme matr karịa egwu ọ na-eti. Ọ na-eme ihe ejije Nollywood ma na-emepụta ndị otiegwu egwu nke Bekee kpọrọ 'producer'. Nke kacha nke bụ na ọ bụ onye na-ahazi akwa nke ọkọka Bekee kpọrọ 'fashion designer'. Ọ haziri Charles Oputa nakwa ejiji ya mee ka o site na onye na-eṅomi ejiji 'Michael Jackson, bụrụ Charly Boy, mmadụ nke onwe ya. Iji kọwaa ka ụtọ Tyna si dị ya n'obi, Charly Boy kwuburu na ọ bụ Tyna Onwudiiwe mere ya ihe ọ bụ taa, si na o si ala Igbo kpọgote ya Legos ma kwụọrọ ya ụgwọ ụlọ afọ abụọ oge ọ gbajuru dọrọ ya. Tyna hazikwara ọtụtụ ndị aha ha na-ada ụda.. na Naijiria oge ahụ. O mechara nwụọ ka ọ gbachaara afọ 47 n'afọ 2001 na Johannesburg dị na mba Saut-Afrịka ebe ka ọ nọ anara nleta n'ụlọọgwụ maka ọrịa kansa. Ọ hapụrụ ụmụ atọ were nwụọ. Ụfọdụ egwu o tiri 7. Alex O Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị na ọ bụ nwa afọ Igbo mana o so na ndị bidoro egwu a na-akpọ 'hip-hop' na Naijiria, ebe ụfọdụ mara ya dịka onye Igbo buru ụzọ mewe egwu 'rap'. A ma ya dịka otiegwu Alex O, mana ezi aha ya bụ Alex Okoroigwe, nwa afọ Imo steeti. O wuru egwu na ngwụcha 80s banye 90s ọ kachasi oge o tipụtara egwu ya ọ kpọrọ, ""Celebrate'. Egwu a wuru ewu oge ọ bụla dị egwu ndị ọcha ka na-akọkarị na redio nakwa ebe a na-eme mmemme. Dika otu onye ntaakụkọ ihe gbasara egwu doro anya, bụ Ngozi Emedolibe si kwuo, ""Alex O bụ nwa afọ Igbo mbu tiri egwu 'rap' na Naijiria tupu ụmụ afọ ndị̀ ọzọ akụwa ụdị egwu ahụ."" Ọ lụrụ ,Oby Edozie, onye na-eme ejije n' afọ 2011, ha mụtara ụmụ abụọ. Alex O. lakpụrụ, aṅụghịkwa maka ya ọtụtụ afọ dịka akụkọ kwuru na ọ lara mba Saụtị Afrịka ga biri. O mechara lọghachị mana mbọ Alex O gbara ịlọghachi n' ịkụ egwu n'afọ 2015 a mitaghị mkpụrụ dịka ndị agba ọhụrụ wegharala ọgbọ. Ụfọdụ egwu o tiri" https://www.bbc.com/igbo/afirika-52572018 +health Intersex: Ihe ndị nwere ọtụ na amụ na-agabiga "Mgbe ọbụla ị nụrụ na mmadụ abụghị nwoke ọ bụghị nwaanyị, Kedụ ihe na-agba gị n'uche? Nke a bụ akụkọ banyere ndị Naịjirịa abụọ James Johnson na Mystique Evolving bu ikpu na amụ pụta ụwa. Mmadụ abụọ ndị a kọrọ akụkọ ha nakwa ihe ndị ha na-agabiga na ndụ n'ihi ọnọdụ a. James Johnson bu ọtụ na amụ mgba a mụrụ ya mana nne na nna ya kpebiri na ọ bụ nwaanyị ma gụọ ya aha Iyabo Abade. James amaghị na ọ pụrụiche rue afọ 1997-1998 mgbe a chọrọ ịgba asọmpi Iko mba Afrịka nakwa Iko Mbaụwa nke ụmụnwaanyị. Dịka obere nwa, Iyabo malitere ịgba bọọlụ mgbe ọ dị afọ iri. Ọ dị afọ iri na itoolu mgbe ọ chọpụtara oke ndịiche dị n'etiti ya na ụmụnwaanyị ndị ọzọ. James sị na o chere na ""ọ bụghị mmadụ"" maka na o nwere ọtụ na amụ. Site na nyocha ndị o mere, ọ chọpụtara na ọ bụ nwoke pasentị iri asaa (70%) na nwaanyị pasenti iri atọ (30%). Nke mere o ji họrọ ịbụ nwoke. Site na mgbe a mụrụ Mystique o nwere amụ gosiri na ọ bụ nwoke. Mana dịka ọ na-etolite, olu ya agbanweghi ka nke nwoke, anụ ahụ ya dị nro ka nke nwaanyị. Ụdị dịka nke nwaanyị. N'ụlọakwụkwọ Sekọndịrị, ezinaụlọ ya na-ebo ya ebubo na ọ bụ onye na-enwe ""mmeko nwoke na nwoke"". N'agbanyeghi nke a Mystique sị ""Amara m na ọ bụghị onye mbụ."" Dịka ọ na-eto, ọ malitere ịkpụ ara dịka nwaanyị. Ọ chọpụtara na akụkọ afọ na-ara ya ahụ kwa ọnwa ọbụla. Mgbe ọ gara ụlọọgwụ, nnyocha gosiri na o nwere akpụ (ovary) abụọ n'ime ahụ ya mana o nweghi akpa nwa. Dọkịnta gwara ya na afọ ahụ na-ara ya ahụ kwa ọnwa bụ oge nsọ nwaanyị nke na ọ na-aghị ahụ. Mystique sị na ezinaụlọ ya niile gbahapụrụ ya n'ime afọ iri ewepụ otu nwanne ya nwoke. Ihe ndị a na-agabiga Oke nsogbu ndị nwere ọtụ na amụ na-enwe na Naịjirịa bụ ịkpaoke site n'aka ezinaụlọ ha nakwa ndị obodo. Ọtụtụ ndụ Naịjirịa amaghị ụdị ihe a, ụfọdụ na-ahụta ha dịka amoosu chọrọ nnapụta maọbụ nke e kwesịrị ịtụgbu n'okwute. Ndị ọzọ na-ahụta ha dịka ndị a bụrụ ọnụ. Nke a mere ọtụtụ n'ime ha ji ezo ezo n'ihi ụjọ amaghị etu ndị obodo ga-esi akpasa ha agwa. ""N'oge ikpeazụ m hụrụ ndị ezinaụlọ m, ha kara egbu m.""| Ha kụrụ m ihe, kpụọ m isi, gbatuo m n'ala,"" Ihe o kwuru. A bịa na nke James, ezinaụlọ ya hụrụ ya kwadoro. Mana ịkpaoke ọ hụrụ n'egwuregwu bọọlụ mgbe ọ ghọrọ nwoke mere o ji kwụsị ịgba bọọlụ na Naịjirịa. Ihe bụ 'ịntersex'? 'Intersex' bụ onye nwere ọtụ nwaanyị na amụ nwoke pụta ụwa mgbe a mụrụ ya. Ọtụtụ n'ime ha na-enwe mgbagwoju anya ma ha ọ bụ nwoke ka ọ bụ nwaanyị. Ọ na-ara ahụ ịkwọwa ma ụdị a dịka nwoke ma ọ bụ nwaanyị maka ha abụghị otu n'ime ndị a. Ndị a bu ọtụ na amụ nọ na Naịjirịa dịka ha nọ na mba ndị ọzọ dị n'ụwa. Mana mba ndị mara na ha dị ma nabata ha na-akpọ ha 'non-binary'. Nke pụtara na ha abụghị nwoke maọbụ nwaanyị. Ndị ọkacha sị na otu n'ime mmadụ puku abụọ na-alọta ụwa bụ onye nwere ọtụ na amụ (Intersex). Mana ọ rara ahụ ị mata ole ha dị na Naịjirịa dịka ọtụtụ n'ime ha na-ezo onwe ha ezo." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49897709 +business Christine Lagarde: Gịnị ka ị kwesịrị ịma maka ya ka ọ na-apụ IMF? Christine Lagarde ga-akwụsị ịbụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka akụnaụba mbaụwa bụ International Monetary Fund (IMF) n'ụbọchị 12 nke ọnwa September. Nke a na-abịa dịka o dechara akwụkwọ n'ụbọchị 16 nke Julaị 2019, iji wụsa ọwa sị na ọ naghị arụzị. N'ime ihe niile a, gịnị ka ị kwesịrị ịma maka ya? Gịnị ka ị ga-eji cheta ya? Onye bụ Christine Lagarde? Ndị nwere ike ịnọchi ya Etu a ọ pụrụ ugbua, ndị mmadụ ekwuola okwu maka onye e nwere ike ịhọpụta ka ọ nọchie anya ya. Kedụ ndị nwere ike ịnọchi ya? David Lipton - Ọ bụ ya ka ndị IMF họpụtara ka a na-arụ ọrụ dịka onye nnochiteanya ruo mgbe a ga-ahọpụta onyeisi ọhụrụ. Ọkwa enwere ike iru ya aka? Mark Carney - Onyeisi ụlọakụ nke Ịngland rụburu dịka onyeisi ụlọakụ nke mba Kanada Olli Rehn - Onyeisi ụlọakụ nke Fịnland ọ nọkwa n'oche ndị na-ahụ maka ọdịmma IMF Kristalina Georgieva - Bụ onyeisi ụlọakụ mbaụwa; ọkwa ọ nọ na ya kemgbe afọ 2017 Lee ihe nkiri a gbasara onye na-ere ahịa mbugharị. https://www.bbc.com/igbo/afirika-49021377 +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Super Eagles ọ ga emeri Aisland? Ihe ndị dị mkpa n'ụtụtụ a Omeiwu Ike Ekweremadu na Eyinnaya Abaribe etinyerela ọnụ na ebubo onyeisiala Buhari boro ndi omeiwu na ha kapụrụ ego e ji aru ọrụ dị mpka mgbe ha hazigharịrị Bojeti afo a. Ekweremadu kwuru na ịrụchapụ ọdọ ụgbọelu Enugwu na ngalaba ndị ọzọ dị ya na ndị omeiwu ndị ọwụwa anyanwụ Naịjirịa mkpa. Sineto Abaribe na onwe ya sị na ọ tụrụ ha n'anya mgbe ha nụrụ maka nkapụ ego a, ma kwuo ndị omeiwu ala Igbo ga-eme nzụkọ gbata gbata maka okwu a. N'ebe ọzọ na Naịjirịa, Akuko na-eru anyị ntị bụ na otu onye uweojii anwụọla na Kadụna steeti ebe ndị shi'hites ji okwute magbuo ya. Agbakwara ụfọdụ ihe ọkụ n'gbaghara dara ebe ndị ofufe shi'hites ahụ mere ngagharị iwe maka onyeisi ha anwụchirị kemgbe 2015. El-Zakzaky: Ndị Shi'ite egbuola otu onye uweojii na Kadụna Na mba ofesi, Akpụpụla nwunye onyeisiala mba Israel bụ Sara Netanyahu ịkpe maka ebubo mpụ na-ekwu na o jị ego gọọmentị kwụọ ụgwọ nrị o gotere. Nwunye Netanyahu agọọla ebubo ndị a ebe ịkpe ahụ jisike aga nihu na Jerusalem. N'egwuregwu, Taa ka anyị ga-ama ma Naịjirịa a ga alata maọbụ gaa ihu na njem ị bụlata ikomba ụwa Super Eagles ga-ezute Aisiland n'ọgbọ egwuregwu Volgograd ma ọ kụọ elekere anọ nke ehihie Ọ bụghị nke ụwe mara mma, dee nuu chapleti na mmiri. Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a https://www.bbc.com/igbo/afirika-44573750 +politics Anambra Women in Politics: 'Ụmụnwoke Anambara achọghị nwaanyị ga-aga ha n'ihu' "Ụmụnwaanyị Anambara na-emesi ihe ike n'agụmakwụkwọ, azụmahịa, nka na ihe ndị ọzọ mana a bịa n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ dị ka ha a na-akụla bandị azụ, naanị nwanyị ole na ole n'ime ha na-aka obi apụta. A bịa n'agumakwụkwọ, mmepụta ngwahịa, ihe ejije na ndị ụbụrụ ha na-acha ọkụ, Anambara nwere ụmụnwaanyị na-emesi ihe ike. Ndị dị ka Oby Ezekwesili, Dora Akunyili, Chimamanda Adichie, Stella Okoli, Sharon Ikeazor wdgz. E lee ya anya na-elu n'elu, a ga-asị na ụmụnwaanyị Anambara chị ọkụ na ndọrọndọrọ ọchịchị dịka ha so na naanị ụmụnwaanyị ole na ole nọ n'ọchịchị.. Iji maa atụ, a bịa n'Ụlọomeiwu Ukwu Agba nke Itoolu, naanị mmadụ asaa n'ime ndị omeiwu mmadụ otu narị na itoolu(109) bụ ụmụnwaanyị . N'ime ụmụnwaanyị asaa ahụ, naanị ụmụnwaanyị abụọ si Ọwụwa Anyanwụ. Ha abụọ bụ Anambara steeti (Stellah Oduah na Uche Ekwunife) . N'otu aka ahụ, n'Ụlọomeiwu Nta Agba nke Itoolu(9th Assembly), naanị mmadụ iri na abụọ n'ime ndị omeiwu 360 bụ nwaanyị. N'ime ụmụnwaanyị iri na abụọ ndị a, naanị abụọ bụ ụmụnwaanyị sị Ọwụwa Anyanwụ (Lynda Chuba Ikpeazu - Anambra na Nkeiruka C. Onyejeocha -Abia.) N'aka nke ọzọ, naanị ụmụnwaanyị Anambara bụ ndị Ọwụwa Anyanwụ so dị n'ime nwaanyị asaa n'ime mmadụ 109 nọ n'Ụlọomeiwu Agba nke Asatọ(8th Assembly). Mana nke bụ eziokwu bụ na ebe ha kwụ dị anya na pasent iri atọ bụ mkpebi Beijing afọ 1995 nke kwuru ka a na-enye ụmụnwaanyị n'ọkwa ọchịchị obodo. Ụfọdụ n'ime ha nọ n'ọchịchị nakwa ikike dịrị onye kọwara ihe ụfọdụ mere ụmụnwaanyị Anambra na-ala az��� n'ihe gbasara ịzọ ọkwa ọchịchị: 1. Ụmụnwaanyị enweghị nkwenye na ha nwere ike imeli ya Ịyọm Josephine Anenih bụbụ Minista na-ahụ maka ụmụnwaanyị kwuru na ọtụtụ ụmụnwaanyị na-akụziri onwe ha na ọchịchị abụghị maka nwaanyị. ""I kwuo okwu ha asị gị, "" Ị na-etinye ọnụ n'okwu ịbụ nwoke?"". Ọ bụghị maka ị gụrụ akwụkwọ maọbụ n' a ịgụghị akwụkwọ, ọ bụ ihe dị n'ime anyị."" ""Achọ ime ntuliaka ọkwa onyeisioche na 'woman leader na pati, ụmụnwaanyị agaghị ekwe etinye akwụkwọ na ndị ga-azọ ọkwa onyeisioche. Ha echere nanị ọkwa 'woman leader'."" ""Ọ bụrụ na ị pụtaghị, onye ga-enye gị ọkwa? Ọ bụghị pụtara ka ịzọ ịzọta i were. Ọ tụrụ arrịrị na ọ bụ naanị ụmụnwoke na-atụnye ọnụ n'ihe gbasara obodo. Dịka Ada Agina-Ude, bụbụ onyeisi otu na-agba mbọ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị a kpọrọ 'Gender and Development Action' (GADA) siri kọwaa, ""Ọtụtụ ndị Anambara nwere nkwenye na 'Nwaanyị ichi nwoke bụ arụ.'"" I lee anya, ọ dị ka ụka na omenala dowere ụmụnwaanyị n'azụ oche. Ndị Anambara ejighịkwanụ omenala na ụka egwu egwu, ya mere ogogo ụmụnwaanyị nọ 'ọchịchị obodo agaghị agba gharịị. Dịka Iyom Anenih bụ onye Amaọbịa dị n'Anambara steeti siri kwuo, ihe nkuzi ụka na omenala na-akụziri ụmụnwaanyị bụ na ọchịchị bụ nke nwoke. Ọ sịrị, ""Ụka na omenala akụziela ụmụnwaanyị na nwoke bụ isi,"" nke mere na ha anaghị ekwe ewepụta onwe ha ịzọ ọkwa Ada Agina-Ude bụ nwa afọ Nnewi, Anambara steeti kwuru na ego dị n' Anambra mana ha anaghị etinye ya na-ịkwado nwunye ha. ""N'Anambara, nwoke na-achọ ka nwaanyị ya bụrụ ihe nlele. O kpata ego ọ zụọrọ ya ụgbọala maọbụ ọgbatumtum mana ịsị na itinye ego ka nwaanyị bụrụ onye ọchịchị ọ gaghị eme ya."" N'otu aka ahụ, Agina-Ude rụtụrụ aka na ụmụnwoke Anambra na-achọ ka nwaanyị ha gaa n'ihi mana ọ ganihu ahụ bụ n'ihu ụmụnwaanyị, ọ bụghị ịga nwoke n'ihu."" Agina-Ude, onye ji Bianca Ojukwu chọrọ ịzọ ọkwa senetọ maa atụ, kwụru na ọ bụrụ na steeti ọzọ dịka Enugwu ka ọ pụtara gosi ọchịchọ obi ya, na ha ga-eji ikwanyere Emeka Ojukwu ugwu nye ya ohere ka ọ zọọ. Ego ji okwu ma ọ bụrụ ndị kwuru okwu. Ego so na ihe na-anapụ ụmụnwaanyị Igbo ọkachasị ndị Anambara ara n'ọnụ n'okwu ịzọ ọchịchị obodo. Oby Kate Okafor bụ onye zọrọ ọkwa gọvanọ Anambara n'afọ 2017 n'aha otu pati Advanced Congress of Democrats(ACB) sịrị, ""ebe ọ na-enye nsogbu bụ na ego e ji eme ntuliaka n'Anambra karịrị akarị."" Okafor kọwara n'ezie na ndị pati dị na Naijiria anaghị ana ụmụnwaanyị ego e ji agba akwụkwọ ịzọ ọchịchị, ""Mana ego ị ga-eji eme ndọrọndọrọ kwanụ? E nye gị ọkọlọtọ, i ji ego i ga-eji eme ndọrọndọrọ?"" Uche Akolisa dere akụkọ, ebe Nnamdi Agbanelo meere onyonyo so ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58892607 +business Emirates, Etihad, Kenya Airways na ndị ọzọ etinyela iwu ị kwesịrị ịhụ tupu i mee njem "Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọelu akpọrọ Federal Airport Authority of Nigeria (FAAN) bụ Henrietta Yakubu kwuru na o nweghị ihe ngalaba ahụ ga-eme maka usoro ụlọọrụ ụgbọelu si ofesi hiwere maka ụmụ Naijiria na-aga mba ọzọ. Nke a na-eme dịka ụfọdụ ụloọru ụgbọelu dịka Emirates, Etihad, Kenya Airways na ndị ọzọ tinyere iwu nke kwuru na onye ọbụla sị Naijirịa chọrọ iso ụgbọelu ha mee njem ga-egosirịrị akwụkwọ nnyocha coronavirus nke gosiri na ha ebughị ọrịa ahụ tupu ha ekwe buru ya. Ha kwuru na akwụkwọ ahụ a ga-eme nnyocha ahụ n'ime abalị anọ tupu onye ahụ emee njem ya. Usoro ndị a gụnyere na onye ọbụla sị Naijirịa eme njem ụgbọelu a ga mba ọzọ ga-egosi ha akwụkwọ nyocha na-egosi na o bụghị ọrịa coronavirus. Nke a wepụrụ ohere ndị mmadụ nwere ịkwụ ụgwọ njem n'oge ka ọ beere ha ego, ebe ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ha anaghị enweta mpụta nyocha ha n'oge . Yakubu kwuru sị ""Obodo niile nwere ikike ihiwe usoro nke ha maka nchekwa ọrịa coronavirus, o nweghị ihe ụlọọrụ FAAN ga-emewnu maka nke a"". O kwukara sị ""Ka mmadụ niile mee njem ofesi nanị mgbe ọ dị mkpa ma ka ha bido kwa n'oge haziwe ihe niile ha ga-eji eme njem a n'oge"". Dịka Naijirịa ebidobeghị njem ụgbọelu nke ofesi, Yakubu na-ekwu na ha na-etikọ isi ọnụ iji wepụta usoro njem ndị si ofesi chọrọ ịbata Naijirịa. Lee ụfọdụ ndi ụlọọrụ ụgbọelu hiwere usoro a: Emirates Etihad Kenya Airways Qatar Airways Cheta na e hinyeburu mmalite njem mba ofesi n'ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọst, tupu e bugharịa ya gaa ụbọchị ise nke ọnwa Septemba. Dịka a na-akwado maka mmehe njem ụgbọelu mba ofesi ụbọchị Satọde na-abịanụ, onyeisioche ọrụ ọtawaike COVID-19 bụ Sani Aliyu adọọla aka na ntị na onye njem ọbụla ghọrọ aghụghọ maka nyocha nje coronavirus na gọọmentị Naịjirịa ga-amachi ya ịbata obodo a. O kwuru nke mgbe ndị otu ọtawaike COVID-19 akpọrọ Presidential Task Force on COVID-19 na agwa ndị nta akụkọ okwu ụnyaahụ. Aliyu kwuru bụ onye kwuru nke a n'Abụja ụbọchị Mọnde sị na ha ewepụtala usoro ọhụrụ maka ndị na-eme njem sị mba ofesi dịka Naịjirịa na-ejikere ịmehe njem ụgbọelu mba ofesi ọzọ ụbọchị Satụde. O kwuru na onye ọbụla na abata Naịjirịa ga-eme nnyocha ahụ Bekee kpọrọ ""Polymerase Chain Reaction test for COVID-19"" n'obodo ha si, wekwara mee ọzọ mgbe ha rutere Naịjirịa. Ọ sị na ndị dara ya bụ ule ahụ agaghị abata Naịjirịa. Ndị ụgbọelu ghọrọ aghụghọ maka ule ndị a ga-akwụ nha $3,500 maka otu onye njem dara iwu a. Ọ dọkwara ha aka na ntị maka onye njem ọbụla agaghị eme nnyocha hụ nke aga eme abali asaa onye ahụ batachara Naịjirịa. Aliyu sị ndị ọrụ Immigration ga-akagbu akwụkwọ ikike njem ya. O kwuru na ya bụ mpụtara nnyocha agaghịzị adị ire ruo abali iri na anọ (14), dịka akara mbụ, kama na ha emeela ya abali asaa malite ụbọchị ha mere ya, na agaghị akarị abali abụọ tupu ha amapụ ya bụ njem. O kwukwara na onye ọbụla ga-aga eme ya bụ nnyocha na Naịjirịa ga-akwụ ụgwọ ya malite na 29 ọnwa Ọgust 2020. Ọgọst 29: Njem ụgbọelu ofesi ga-amalite na Naịjirịa n'ụbọchị a Minista na-ahụ maka njem ụgbọelụ bụ Hadi Sirika ekwuola na njem ụgbọelu ofesi ga-amalite na Naịjirịa n'ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọst. O kwukwara na ọ bụ ọdọụgbọelu Legọs na Abuja ka njem a ga-ebu ụzọ malite. O kwukwara na ọ ga-ewepụta usoro nakwa iwu ndị pụrụiche ga-ekpuchi njem a n'oge adịghị anya. Mana akụkọ si n'akụkụ tebulu otu ""presidential task force"" na-ekwu na esubeghị oge mmepe njem ofesi kpọm." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53655643 +entertainment Patoranking gwara anyị ihe kachasị ya mkpa n'ụwa Patoranking gwara BBC Igbo service na ọ chọrọ imetụta ndụ ndị Naijiria ruru puku 100 site i nye ha nrị na ibi nkeọma. https://www.bbc.com/igbo/43148541 +politics Etu nsogbu dị na PDP na APC nwereike isi metụta ntuliaka 2023 Dịka ntuliaka 2023 ji ọsọ agba, achụmntavootu ga-amalite kpọm kwem n’ụbọchị 28 nke ọnwa Sepụtemba mana pati abụọ nwere agba na Naịjirịa nọ n’ọnọdụ kata kata. Nsogbu ndị na-eselite isi na pati abụọ a bụ People’s Democrative Party (PDP) na All Progressives Congress (APC) abụrụla ihe ọha na-agba nkiri n’oge ntuliaka a. Ụfọdụ ndị ọkachamara n’ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ekwuola na ọ bụrụ na patị abụọ a esepụghị aka enwe n’ofe, na o nwere ike ịghọ aka mmadụ. Ọ bụghị akụkọ ọhụrụ na kemgbe PDP mechapụrụ ntuliaka ime ụlọ ha na nsogbu si azụ ụlọ banye be ha. Na ụbọchị 21 nke ọnwa Septemba a, gọvanọ Nyesom Wike nke Rịvas steeti na ụfọdụ ndị kwụnyere ya na patị ahụ kwuru n’ọha na ha agaghị esozi n’otu na-ahazị achụmnta vootu na patị ahụ bụ otu a kpọrọ ‘Campaign Council’. O kwuru na ha na-eme nke a n’ihi onyeisi oche pati ahụ bụ Iyorcha Ayu ekweghị enye onye ọzọ si na mpaghara ndịdịa anyanwụ ohere ịnọ na ya bụ ọkwa. Otu onye ọkaibe n’okwu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Sani Bala gwara BBC na okwu mpaghara ebe ndị mmadụ si so n’ihe kacha emebi ihe na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa. O kwuru “Ndị mpaghara ugwu kwesịrị igosi ọchịchọ ihe gbasara ndị ndịda, ndị ndịda kwesịrị igosi ọchịchị ihe gbasara ndị ugwu.” Cheta na Wike arụọla aka ugboro ugboro na etu Ayu siri nọrọ n’ọkwa ahụ megidere iwu patị ahụ nke metụtara iweghari ọchịchị si na mpaghara gaa mpaghara. Mana okwu Wike na PDP nwere metụtakwara onye ji ọkọlọtọ patị ahụ azọ ọkwa onyeisiala 2023 bụ Atiku Abubukar. Okwu ya na Atiku dapụtara dịka o nweteghị mmerị na ntuliaka ime ụlọ patị ahụ e mere n’ọnwa Maachị. Wike pụtara dịka onye so Atiku na-azụ na ya bụ ntuliaka, dịka o bụ onye si mpaghara ndịda Naịjirịa ma bụrụkwa onye okpukperechi Kraịsti, ọtụtụ tụrụ anya na Atiku ga-ahọrọ ya dịka osote ya mana Atiku kpọpụtara aha gọvanọ  Ifeanyi Okowa nke Delta steeti dịka osote ya. Nke a mere ka iwe Wike dị ọkụ dịka o kwuru na Atiku egeghị ndụmọdụ kọmitịị patị ahụ nke Samuel Ortom nọ n’isi ya nyere maka nhọpụta osote onyeisiala ntị. Bala kwuru na “Ọ bụrụ na PDP chọrọ inweta mmerị na ntuliaka 2023, ha kwesiri ikpezi okwu nọ n’etiti Wike na Atiku ngwa ngwa” Mgbe nke a mere, Wike  “O nweghị onye m bụ odibo ya, agaghị m abụ odibo onye ọbụla.” O kwekwara nkwa ugboro ugboro na ọ ga-agba n’ọha ihe nzizo ndị na-eme na pati ahụ. N’ụbọchị 23 nke ọnwa Septemba, Wike boro Iyorchia Ayu ebubo na o tinyere aka n’usoro na-ezighi ezi na nhazi ntuliaka ime ụlọ patị ahụ. O kwuru “Ọ (Ayu) ji ụzọ agụghọ megherie ndị ‘delegates’ anya, E nweghị ihe ọ meghị iji hụ na Wike enwetaghị mmerị” Bala kwukwara na dịka oge ntuliaka nọzị nso na ọtụtụ patị ga-achọ ebe ọpịọ dị na patị ndị ọzọ ma si ụzọ ahụ na-akwanye ọkụ nsogbu na pati ha dịka nke a ga-enyere ha aka nweta mmerị. Ebe nsogbu APC na nso nso so pụtara ihe mgbe onye ji ọkọlọtọ patị ahụ azọ ọkwa onyeisiala bụ Bola Ahmed Tinubu kpọpụtara aha Kashim Shettima dịka osote ya. Ọtụtụ katọrọ mkpọpụta nke a n’ihi ha abụọ bụ ndị okpukperechi alakụba. Agbanyeghị na iwu Naịjirịa emegideghị nke a, omenala ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa kemgbe na-akwado ka onye okpukperechi Kraịstị na onye okpukperechi alakụba zọkọọ ọkwa abụọ ahụ. Nke a bụ iji hụ na e tinyere ndị ebe a, e tinyere ndị ebe a. Otu nwoke ọzọ bụ ọkaibe n’okwu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Lekan Ige gwara BBC na okwu okpukperechi bụ okpotokpo okwu ugbua na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa. O kwuru na mgbe ụdịrị ihe mebụrụ bụ mgbe ndị alakụba abụọ zọkọrọ ọkwa onyeisiala na osote ya na 1993, ọnọdụ ịdịnaotu Naịjịrịa adabeghị etụ a. Ige kwuru “Ọ dịzịrị ndị APC ikpezi iwe dị n’etiti ndị otu ha ma ọ bụrụ na ha chọọ ọdịmma patị ha ugbua.” Otu onye nwere agba na patị ahụ ma bụrụkwa onye bụbu ọdeakwụkwọ gọọmentị etiti bụ  Lawal so katọọ ihe a ma kwuo “Ndị nille hụrụ ịdịnaotu Naịjriịa n’anya ọkachasị ndị si mpaghara ugwu kwesịrị ịma nhọpụta ndị alakụba abụọ a agaghị achịta aja.” Onye bụbu onyeisi ụlọomeiwu nta Naịjirịa bụ Yakubu Dogara katọkwara  nke a n’ọnwa a ma kwuo na ọ kwunyeghịrị ya bụ ihe. O kwuru na ọgbakọ  Nigeria National Christian bụ ọgbakọ ndị otu jịkorọ ụka Kraịstị e mere n’Abuja ma kwuo “Aga m e foro ntutu taa ịhụ na ndị ụka Kraịsti emefughị vootu ha n’efu” Nsogbo ozọ bụkwa nsogbo nọ n’etiti Ahmed Lawan na Bashir Machina. Ka ọ dị ugbua, onyeisi ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa bụ Ahmed Lawan agaghị eso zọọ ọkwa Sineti na 2023. Nke a bụ ihe gbara n’ọha dịka ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec n’ịchafụ zipụtara akwụkwọ ndị ga-azọ ọkwa n’izuụka a. Lawan so na ndị zọrọ ntuliaka imeụlọ APC maka ọkwa onyeisiala, mana ọ nwetara naanị vootu 152. Akụkọ kwuru na oge Lawan chọrọ ịlaghachi azụ ga zọọ ọkwa Sineti nke Yobe North, onye meriri ntuliaka imeụlọ APC maka ọkwa ahụ bụ Bashir Machina jụrụ ajụ irituru ya. Nke a e bụtela ọtụtụ okwu n’etiti ha abụọ dịka Machina ka gbara isi akwara n’ọkwa ahụ. Ka ọ dị ugbua, Inec etinyeghị ma aha Ahmed Lawan ma nke Bashir Machina n'akwụkwọ a ha bipụtara. Anya ọha na-ele pati abụọ a dịka ihe ndị a na-echere ha aka mgba nakwa otu ihe ọzọ bụ mpụta patị ọzọ na-ewu ewu ugbua nke na-emetubeghị na nso nso na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjriịa. Etu aha pati Labour party na onye ji ọkọtọlọ patị ahụ azọ ọkwa onyeisiala bụ Peter Obi si ewu abụrụla ihe ịtụnaya nye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa. Ite nọ n'ọkụ na-esi ugbua, dịka ọha na-echezị ka nrị ghee na ntuliaka 2023. Bala na Ige gbara ama na ihe ndị ga-emetụta ntuliaka a na-abịa mana amabeghị etu ya bụ ihe ga-esi gaa. https://www.bbc.com/igbo/articles/cyrx2mmd3d2o +entertainment Dice Ailes: Onye bụ 'Sarah Baartman' a e ji maka ya adọri ya? "Sarah 'Saartjie ' Baartman bụ otu nwaanyị ụfọdụ akụkọ ụwa agaghị echefu maka ihe ọ gabigara n'aka ndị ọcha oge ọ bụ ohu. Baartman bụ nwaanyị mba Saụt Afrịka otu dọkịta mba Briten kpọfere ala Bekee, hụrụ nwịị n'obodo oyibo makana e ji ya were na-eme akaja ma bụrụ onye ọha na-abịa agba nkiri. Dịka akụkọ mgbe ochie si kwuo, dọkịta ahụ tinyere ya ebe a na-akpọ ""museum"" ka ndị ọcha ibe ya na-ele ya anya ịkwa emu maka etu ahụ ya dị (o nwere nnukwu otele nke ọtụtụ ndị ọcha ahụtubeghi mgbe ahụ). Akụkọ a kwukwara na o nwere ọrịa otele ukwu a kpọrọ ""steatopygia"". N'agbanyeghi ihe Baartman gabigara mgbe ọ dị ndụ, na ọ nwụrụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Disemba n'afọ 1815 ka ọ dị naanị afọ 26, akwụsịghị mkparị akparịrị ahụ ya. Otu onye ọcha a kpọrọ Georges Cuvier chịkọrọ ma ụbụrụisi ya, ọkpụkpụ ahụ ya nakwa ihe ndị o ji bụrụ nwaanyị (sexual organs), wee ka na-edowe ya ebe igwe mmadụ ga na-abịa agba ya nkiri n'obodo Paris dị na mba Frans. Ha gbagidere ya n'anwụ ruo afọ 1974, mana ọ bụ n'afọ 2002 ka ndị mba Saụt Afrịka bịara kporo ihe fọrọ n'ozu ya ma lie ya n'ala ha. Dice Ailes bụ otiegwu ezigbo aha ya bụ Shasha Damilola Alesh tiputara egwu ọhụrụ ọ kpọrọ ""Gịnịka"". Na foto o ji egosipụta egwu a ọ sị bụ maka ịgwa ụmụnwaanyị na ha nwere ike iji ahụ ha mere ihe ọbụla masịrị ha, o ji eserese Sarah Baartman tinye n'elu ya. Nke a mere ka ndị mmadụ dọkawa ya ka mpempe akwụkwọ, na-ekwu na ọ dị ka ọ maghị ihe Baartman gabigara ọ ga-eji were na-akparị ya na-aga n'ihu. Ailes na onwe ya ka ọ na-agbara isi onwe ya depụtara ebumnuche ya n'elu Twitter. @Abisolathegreat kwuru sị na Ailes kparịrị Baartman site n'ihe o mere, ma jụọ ma ọ makwa onye nwaanyị o ji eserese ya mee ihe a bụ? @cremechic11 kwuru na ọ bụghị etu a ka e kwesịrị isi too nwaanyị ahụ. @ekesunvictor kwuru na ọ bụ maka ụdịrị ihe a ka o ji ewe iwe maka otu nwoke na-eke ụmụnwaanyị agbụ. @_bhadmus kwuru na nke a gosiri na akụzighi akụkọ mgbe gboo n'ụlọakwụkwọ etu e kwesịrị isi mee ya. @_mimiAbu kelere Ailes sị na ọ bụ maka ya ka o ji mara onye Baartman bụ ugbua. @OlumideOG kwuru sị na ọ ghọtaghị ihe mere e ji akpọ Ailes aha ọjọọ maka ito ahụ Baartman. Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50227971 +politics A tọọrọ ndị ọrụ Inec na ntuliaka nhọpụta ndị omeiwu ọhụrụ n’Imo steeti? "Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Michael Abattam gwara BBC Igbo n'ụbọchị Sọnde na enweghi ozi maọbụ mkpesa ọbụla ha nụrụ banyere ndị ọrụ ngalaba Independent National Electoral Commission (Inec) ejichiri n'ike maọbụ tọrọ n'ụbọchị Satọde. Akwụkwọ ozi nke Charles Ugwu bụ onyeisi oche otu pati People's Democratic Party n'Imo steeti katọrọ mpụtara ntuliaka nke họpụtara ndị omeiwu ọhụrụ emere na Ngor-Okpala nke steeti ahụ n'ụbọchị Satọdee. O kwuru na usoro ya bụ ntuliaka ezighi ezi. Ugwu boro Gọvanọ steeti ahụ ebubo ma kwuo na o tinyere aka ma nye ndị uweojii iwu ka gbaa egbe aghara aghara ma jibido ọtụtụ ndị ọrụ Inec n'ike. O kwukwara ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa wakporo ọtụ wọọdụ ebe emere ntuliaka a ma gba ndị mmadụ egbe ka si chọọ. Akwụkwọ ozi a bokwara ebubo na e bubara ndị ọrụ Inec a ejibidoro n'ike n'ime Sam Mbakwe ma majaa ha ka ha binye aka tụọ vootu n'ụzọ n'ezighi ezi. Abattam anabataghi ebubo a dịka o kwuru na mkpesa ụdị akụkọ dị etu a gara iru ha ntị kamgbe ihe a mere. Ngalaba na-ahụ maka nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ The Independent National Electoral Commission (Inec) ekwubeghi ihe ọbụla banyere ebubo kama ha akpụpụtala ndị ha si nwetere mmeri na ntuliaka ịhọpụta ndị omeiwu ọhụrụ e mere na mpaghara n'Ondo, Imo na Cross Rivas Steeti n'ụbọchị Satọdee. Ọkamụta Rufus Ogunseemi nke mahadum Federal University of Technology, Akure kpọpụtara mpụtara ntuliaka a na mpaghara ebe ndị emere ya. Site n'ihe Inec kpọpụtara, mpụtara ntuliaka a gosiri na Blyden Amajurionwu nke otu pato All Progressives Congress (APC) nwetere mmerị dịka ahọpụtara ya ka onye omeiwu ọhụrụ ga-anọchịte anya okpuruọchịchị Ngor-Okpala. Dịka Inec si kwuo, Amajurionwu ji vootu 9,248 wee nweta mmeri. Inec kpọpụtara Mayokun Alade nke pati APC dịka onye meriri n'Ondo steeti ịnọchịte anya okpuruọchịchị Akure North/South ebe Jude Ngaji pati APC nwetere mmeri dịka onye ga-anọchite anya okpuruọchịchị Ogoja/Yala. Hope Uzodinma bụ Gọvanọ Imo steeti kwuru n'ụbọchị Sọnde etu obi dị ya maka mpụtara ntuliaka a. Ozi ya ekwughi ihe ọbụla banyere akụkọ a na-efeghari kama ọ gara n'ihu kwado mpụtara ya bụ ntuliaka Ọ mere nke a n'ụlọụka nke obi gọọmentị dị n'Owerri. N'okwu ya ọ sị: ""Soro m kelee chineke etu o si gbapụta ndị okpuruọchịọchị Ngor-Okpala n'aka ịke agbụ ji ha kamgbe"" O toro ndị niile pụtara mee achụmnta vootu nakwa ndị pụtara tụọ vootu. Uzodinma nyekwara ndị ọrụ nchekwa ekele pụrụiche ma too ha maka etu ha si rụọ ọrụ na ya bụ ntuliaka. O jikwa obi aṅụrị tie onwe ya aka n'azụ dịka o kwuru na ọ bụ n'oge ọchịchị ya ka otu pati APC nwetere mmeri dị ịcheịche na steeti ahụ nke gụnyere mmeri Princes Miriam Onuoha na nke Sineto Frank Ibezim nwetere n'Okigwe North Federal Constituency nakwa n'Imo North. Ndị bi na mpaghara Ngor-Okpala dị n'Imo steeti apụtara n'igwe ịhọpụta onye omeiwu ọhụrụ ga-anọchi anya ha n'ụlọ omeiwu steeti ahụ n'ụbọchị Satọdee. Ngalaba 'Independent National Electoral Commission' (Inec) na-ahazi ntuliaka a iji dochie Tochi Okereke, bụ onye meriburu ya bụ ọkwa, mana ọ naghị aga ọgbakọ ndị omeiwu. Ya bụ ntuliaka malitere ka ọ gafechara elekere asatọ nke ụtụtụ Satọde, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Febrụwarị afọ 2022. Onye ntaakụkọ BBC Igbo chọpụtara na ndị ọrụ Ince nakwa ngwaọrụ ha wụchịrị n'ebe dị icheiche a-anọ tụọ ya bụ vootu. Otu ndọrọndọdọ ọchịchị sonyere na ntuliaka nke Satọdee dị iri na otu n'ọnụọgụgụ. Mana ndị ma ihe ekwe na-akụ na ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwu na ya bụ ọgụ ga-aka sie ike n'etiti otu 'Peoples Democratic Party' (PDP), PDP na ndị All Progressives Congress' (APC). Ndị na-anọchi anya pati abụọ ahụ na ntuliaka a bụ Jeff Nwachukwu - PDP, na Blyden Amajirionwu - APC Cheta na Tochi Okereke, onye omeiwu nke a chụpụrụ achụpụ, nọbu n'otu PDP, nke a mere ọtụtụ ji ekwu na ndị PDP ga-emerikwa ntuliaka nke a. Mana chetakwa na ọchịchị Imo steeti ugbua dịzi n'aka pati 'All Progressives Congress' (APC), dịka ụlọikpe kachasị chụtuchara Emeka Ihedioha nke PDP dịka Gọvanọ Imo steeti ma tinye Hope Uzodinma nke APC. Ụfọdụ na-ekwu na n'ihi mgbanwe ọchịchị a, otu APC nwere ike imeri ntuliaka a nke na-aga n'ihu ugbua. Chetakwa na ngwangwa Hope Uzodinma weghaara ọchịchị, ọtụtụ ndị omeiwu Imo Steeti si na pati PDP pụọ, banye APC. Ka ọ dị ugbua, ndị pati APC ka ọnụọgụgụ ha karịrị n'ụlọ omeiwu Imo steeti." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60532802 +politics Ọ bụ eziokwu na APC, PDP na APGA n'Imo North ekposaala, banye Labour Party? "Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ ndị otu 'All Progressives Congress' (APC); 'Peoples Democratic Party' (PDP), na 'All Progressives Grand Alliance' (APGA), na mpaghara Imo North, ekwuola na ọ bụ 'Labour Party' ka ha ga-akawado na ntuliaka onyeisiala Naịjirịa ga-adị n'afọ 2023. Ọtụtụ mmadụ gbakọrọ n'obodo Umuaro nke dị n'okpuru ọchịchị Isiala Mbano, Imo steeti n'ụbọchị Sọnde, abalị iri na itoolu nke ọnwa Jun, iji kwupụta nke a. N'ọgbakọ ahụ, Chikwem Onuoha, onye si APC pụọ banye Labour pati, kwuru na ihe mere ha ji mee mkpebi a bụ maka na ha kwenyere na Peter Obi, onye ji ọkọlọtọ 'Labour Party' azọ ọkwa onyeisiala. Onuoha kwuru sị: ""Peter Obi egosila na ọ bụ olileanya ndị nkịtị na Naịjirịa, ya mere anyị ji kpebie ịkwado ya."" ""Ka ọ dị ugbua, n'ime ndị niile pụtarala ịzọ ọkwa onyeisiala na 2023, Peter Obi bụ onye anyị kwenyere na ọ kacha ndị ọzọ mma."" Mana Cajetan Duke, bụ ọnụ na-ekwuru APC n'Imo steeti, gwara BBC Igbo na Chikwem Onuoha bụ onye mmiri na-eri na-achọ ebe ọ ga-ejide aka. ""Onuoha azọọla ọchịchị ugboro ugboro na APC ma kụọ afọ n'ala; ugbua ọ gbakpuola Labour Party,"" Duke kwuru. ""APC bụ pati a kacha mara aha ya n'Imo steeti. Ị gaa n'Okigwe Zone, Onuoha esoghi na ndị a ma aha ha n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị."" ""APC Imo steeti kwụ chịm na-akwado onye jia aha pati anyị azọ ọkwa onyeisiala, bụ Bola Ahmed Tinubu."" N'otu aka ahụ kwa, BBC Igbo kpọtụụrụ John Iwuala bụ onyeisi Apga n'Imo steeti, o wee kwuo na ihe niile Chikwem Onuoha kwuru bụ okwu asị. O kwuru na 'Labour Party' aghọọla ogige ịgbaga ọsọ ndụ nye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-achịtaghị aja. Iwuala kwuru sị: ""Chikwem Onuoha nọbụ na Apga, si ebe ahụ mabaa PDP, sikwa ebe ahụ makpuo APC, ugbua ọ banyela Labour Pati."" ""Onuoha achịtaghị aja na ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo steeti. O nweghị ikike ikwuchitere APGA ọnụ."" ""Apga nwere ndị tozuru etozu na-azọ ọkwa ọchịchị na mpaghara niile dị n'Imo North."" BBC kpọkwara Collins Opuruozor, bụ onyeisi mgbasaozi ọgbara ọhụrụ na PDP Imo steeti, mana ọ zaghị ekwentị ya ugboro ugboro. Ọ bụ okpuruọchịchị isii mebere mpaghara a na-akpọ Okigwe Zone n'Imo steeti. Ha gụnyere: ""Ehime Mbano; Ihitte/Uboma; Isiala Mbano; Obowo; Okigwe; na Onuimo." https://www.bbc.com/igbo/articles/cjr95pxld28o +sports Women's World Cup 2019: Afrịka, ka emesia Ndị mba Inglandị e jiri la okpụ gool atọ asataghị ma otu were memilaa olileanya ndi Afrịka nwere mgbe ha na Cameroon zutere n'ubochị taa. Kamerun ji nkata kporo goolu a n'aka Houghton na nkeji 14, White na nkeji 45+4 nakwa Greenwood na nkeji 58. Kamerun nwara ike ha ịsata goolu ndị a mana ọ mịtaghị mkpụrụ. Otu abụọ a zutere onwe ha na Valenciennes i ji mara ndị ga abanye agba nke atọ na asọmpị a. Cheta kwa na ndị otu egwuregwu Cameroon nyere otu gool ma VAR kagburu ya si na ọ bụ 'Off side' . Mmmeri mba Ingland meriri Cameroon agbapụla mba Afrịka niile kpọm kwem n'asọmpị iko Mbaụwa ụmụnwaanyị. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48739405 +sports Women's World Cup 2019: Ụmụnwaanyị Amerịka ebuliela iko Mbaụwa nke ugboro anọ Ndị egwu bọọlụ ụmụnwanyị nke mba Amerịka emeela ndị ogbo ha nke mba Netherlands taa kpuchie ọnụ n'asọmpi nke ikpeazụ Iko Mbaụwa taa. Amerịka ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata wee menyụọ ndị Netherlands anya ma maburu ya bụ iko. Ọkpụ goolu gaara akarị akarị ma ewepu onye oche goolu ndị Netherlands onye gosiri na ọ bụ agụ nwanyị n'ezie. Mana na nkeji 61, ndị Amerịka nwetara penariti nke onye ndu ha bu Megan Rapinoe gbakpuru wee kọwaara ndị Netherlands na-egwu apụọla na nke achị ụtaba n'aka agba. Rapinoe onye gbara afọ iri atọ na anọ bụ nwanyị kacha bụrụ okenye nke nyerela goolu n'asọmpi Iko Mbaụwa ụmunwanyị Na nkeji 69, Rose Lavelle mezuru ya ọkpụ abụọ, nke bụ goolu nke atọ ọ na-enye n'asọmpi nke afo a. Mmeri a egosila na mba Amerịka bụ ọkaibe ma a bịa n'egwuregwu bọọlụ ụmụnwanyị. Nke a bụ ya ugboro anọ ha na-eturu ugo na ya bụ asọmpi kemgbe amalitere ya n'afọ 1991. Nke gụnyere 1991, 1999, 2015 na 2019. Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48903125 +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Onye nkuzi ndi Jamani sị na ọ dị mma ka esị gbapụ ha "Ha kwesiri ịgbapụ Jamanị n'iko mbaụwa - Onyenchịkọta ha N'egwuregwu, onye na-achịkọta otu Jamani n'asọmpị iko mbaụwa bụ Joachim Low ekwuola n'ezie na ekwesiri ịgbapụ agbapụrụ ha n'asọmpị a makana ndị otu ya agbaghị nke ọma cha cha na ya bụ asọmpị. N'akụkọ nyiri ibe ya, ndị ga asụ mpi nke ha taa bụ Senegal na Kolombia, Jaapan na Poland, Panama na Tunisia, na kwa Ịngland na Belgium. Iwe di n'obi ndị Biafra Zionists Federation Otu kpọrọ onwe ha Biafra Zionists Federation emela ngagharị iwe n'ihu ụlọikpe dị n'Enugwu makana ndị uweojii akpọpụtaghị onyeisi ha bụ Benjamin Onwuka na ndị otu ya bịa ụlọikpe n'ụbọchị ikpe ha. Cheta na ndị uweojii nwụchịrị Benjamin Onwuka na ndị otu ya makana ha wakporo obi gọọmenti nke Enugwu steeti n'ụbọchị ncheta Biafra. ""Arukwahị m!"" - Ndị nkuzi Cross River N'okwu gbasara agụmakwụkọ ka ndị nkuzi ụlọakwụkwọ primarị na sekọndarị ga-ebido arukwahị m taa na Cross River Steeti. N'ime akwụkwọ onyeisi ha bụ Eyo-Nsa Itam dere, ha kwuru na iwe ha bụ na gọọmentị azabeghị ihe ọbụla ha na-arịọ ha kemgbe maka ihe ọdịnma gbasara ndị nkuzi. Uru ọ ga-apụta n'ọgbakọ Trump na Putin? Na mba ofesi, gọọmentị ala Rọshịa ekwuola na onyeisiala Amerika bụ Donald Trump na onyeisiala ha bụ Vladimir Putin ga-enwe ọgbakọ n'ala ọzọ akpobeghị aha. Rọshịa na-enwe olileanya na ọgbakọ a ga-edozi mmekọ dị na-etiti ala ha na Amerịka. Gee akụkọ anyi n'otu nkeji Lee ihe nkiri anyị" https://www.bbc.com/igbo/media-44640688 +politics Akụkọ kachasị taa: Buhari akatọọla ọnwụ ndị Fada na Benue taa Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Ndị uweojii n'Enugwu ekwuola na ha ga-emebi ogbunigwe a chọpụtara liri n'ala site n'oge agha. Akwụkwọ onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ha ga-ebido imebi ogbunigwe ahụ echi. Ndị ọchịehi egbuola ụkọchukwu abụọ na ndị ọzọ Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla ogbugbu e gburu ndị ụka Katọlik na Benue taa. Ndị ochiehi wakporo ụlọụka St Ignatius nke ndị katọlik wee gbuo ndị fada abụọ ndị na-aka ụka ebe ahụ. Okwu dị n'etiti ndị uweojii na Sinetọ Dino Melaye abala agba ọzọ. Ndị uweojii kpọrọ Melaye gawa Lokoja taa, ihe ndị mma na-ajụ bụ ma a ga-akpọgharị ya n'etiti ndị ohi? Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump adọọla mba Iran aka na ntị gbasara ngwọagha nuklia. Trump bụ onye na-ele onyeisi mba France bụ Emmanuel Macron ọbịa kwuru na nnukwu nsogbu ga-adịrị Iran ma ha bidogahrịa imepụta ngwọagha nuklia ọzọ. N'egwuregwu Liverpool ga anabata ndị AS Roma taa n'asọmpi ọkara ikpeazụ Uefa Champịọns ụkwụ nke mbụ ya. Mohammed Salah nke Liverpool ga-enwe ohere izute ndị AS Roma bụ ebe ọ gbaburu bọọlụ n'oge gara aga. Nkeji nke mgbede a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Nwaanyị mụrụ ejima atọ mana ọ maghị ebe di ya nọ kamgbe ọnwa Disemba afọ 2017. https://www.bbc.com/igbo/afirika-43882572 +politics Ihe mere Inec jiri kagbuo aha mmadụ otu nde debanyere aha ha ịtụ vootu Ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ The Independent National Electoral Commission (Inec) zipụtara ozi tụrụ ọha n’anya nke kwuru na ha kagburu aha ihe ruru otu nde na ụma ndị debanyere aha ha iso mee ntuliaka nke 2023. N’ozi nke pụtara n’izu a ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye kọwara na ndị a kagburu aha ha bụ ndị mere mmehe n’usoro ndebanye aha a. Okoye kọwara BBC Igbo n’ụbọchị Wenezde na ọtụtụ ghọtahere ozi ya ma gaa n’ihu kọwa ihe mere e jiri kagbuo aha ndị a. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, o kwuru: “Ndị a anyị kagburu aha ha bụ ndị debanyere  aha ha ugboro abụọ nke bụ na ndị a edebanyebuola aha ha n’akwụkwọ anyị n’oge gara aga”. Ọ kọwara na iji gbochie nghọtate na Inec anaghị anabata ndebanye aha ugboro abụọ. Ọ gara n’ihu gwaa ndị akwụkwọ ikike itu vootu ha nke a na-akpọ PVC dịzị nkịrịnka ugbua ka ha ghara ịtụ ụjọ ma jide ya bụ PVC gaa tụọ vootu n’ụbọchị ntuliaka n’ihi na aha ndị ahụ ka nọ n’akwụkwọ Inec. Mana iji saa maka ndị a debanyere aha ha ugboro abụọ, o kwuru na enweghị ngwọta mmehie ugbua ruo oge e mechara ntuliaka 2023. Okoye kwukwara na aga ebipụta aha ndị a n’uju na ọdịnso ka ọha ghara ịsị na akpapụrụ ha n’iso mee ntuliaka 2023. O kwukwara na Inec nọ n’usoro ihazi aha ndị niile tozuru oke ma debanye aha ha ugbua dịka a ga-ewepụta akwụkwọ ikike ndị mmadụ malite n’ọnwa Ọktoba 2022 ma kwukwa na Inec ga-ezitere ndị mmadụ ozi site n’ekwenti ha nakwa na Ịmealụ ma a hazịchaa akwụkwọ ikike ha. Okoye sara ajụjụ banyere ebubo ndị na-edebanye aha ha na-etozubeghị oke ma kwuo na usoro ọrụ Inec na-akpachị atụmatụ dị etu a ma kpokuo ọha ka e tinyere ha aka n’inyopụ atụmatụ dị etu a ma gbaa ya n’anwụ. Maka okwu ndị na-egobi vootu n’oge ntuliaka, o kwuru na Inec na-agba mbọ ịhụ na ndị omeiwu mere iwu ngwa ngwa ga-ata onye ọbụla e jidere ahụhụ dịrị ya. Na nchịkọta, o kwuru na ọ bụrụ na ndị ụlọomeiwu Naịjirịa enweghi ike binyeaka n’iwu a na ikike ka dịrị ndị ọrụ nchekwa ịnwụchi onye ọbụla e jidere na-azụ vootu n’oge ntuliaka. Kirie ihe onyonyo a, ka ị nụrụ ihe Okoye kwuru n’uju. https://www.bbc.com/igbo/articles/cy9l0y3pkkxo +business Ọgba mbọ: 'Amụtara m ọrụ 'welder' na-enye m ego ugbua mgbe m nọ n'ụlọmkpọrọ' Ifeanyi Agwagu bụ onye 'welder' na-eme ọfụma ugbua mana lee ka o si mụta ya bụ aka ọrụ n'ụlọmkpọrọ. Ọ gara ụlọmkpọrọ maka mpụ o mere n'obodo ruo afọ abụọ. O kwuru na oge mbụ ọ batara n'ulọmkpọrọ, o che na ọ ga-anwụ, mana ugbua ihe ọ mụtara enyewela ya ego. Gere ya n'uju n'ihe nkiri a: https://www.bbc.com/igbo/afirika-56636886 +entertainment Chieftaincy title: Ihe ọ na-ewe nwaanyị inweta echichi n'ala Igbo "Abịa n'ihe gbasara echichi n'ala Igbo, ụmụnwaanyị katara ahụ ka a na-echibu ya, mana ugbua ọtụtụ ndị na-echizi echichi n'agbọghọbịa. Enweghị mgbe Igbo sọrọ nsọ nwaanyị ichi echichi, kama mgbe gboo naanị ụmụnwaanyị lụrụ di maọbụ nwere ezigbo ego ka ọ dịịrị ichi echichi, mana ugbua, afọ ole nwaanyị dị anaghị egbochi ya ichi echichi. Ụmụnwaanyị na-eme ọfụma n'azụmaahịa maọbụ gụrụ akwụkwọ ọfụma chọrọ ichi echichi ga-echinwu ya ma ọ bụrụhaala na uche ya dị ya, ma bụrụkwa na ọ ga-emenwu ihe dị n'ime ya. Tupu nwaanyị Igbo echie echichi, ego ji ọrụ. Ọ ga-eme ọtụtụ ihe e ji ego eme. Akụkọ kwuru na ihe kpatara e ji eme ihe ego otu a bụ ịmata ma nwaanyị na-achọ ichi echichi onwere ikike ịbụ ""omere ọha"" ma ihe ndapụta dapụta. Ụbọchị a ga-akpọpụta ya n'ihu ọha ugboro abụọ ebe ọ ga-eji egwu duputa ụmụnwaanyị ndị ọzọ chiri echichi n'ihu ọha. Na nwaanyị chiri echichi agaghị eme ya ka o nweta ohere ime ihe ụmụnwoke ibe ya nwere ike ime. Oge ụmụnwaanyị anọ a nwetara echichi ha, ha alụbeghị di. 1) Ome ihe nkiri bụ Genevieve Nnaji chiri echichi 'Eze Ada nke Amuzu Nweafọr' n'afọ 2014. 2) Chika Ike bụkwa onye na-eme ihe nkiri chikwara echichi 'Akwa Ugo mbụ nke Amoli' n'afọ 2013. 3) Oge Okoye nwetara echichi 'Igolo Nwaanyị mbụ nke Awgu' n'afọ 2013 4) Tonto Dike nwetara echichi 'Adadịọramma nke mbụ na Nollywood' ya n'afọ 2017 Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-46028677 +religion 2021 Prophecies: Ndị mere na ndị emeghị n'amụma Mbaka, Adeboye na ndị ụkọchukwu ndị ọzọ "Na mbido afọ, ọtụtụ ndị ụkọchukwu na ndị amuma a na-anụ aha ha kwụpụtara ihe ha sị Chineke gwara ha ga-eme n'afọ 2021. Dịka afọ 2021 na-apịakọ ọnụ, anyị lere anya n'ihe ụfọdụ ha kwuru ga-eme iji mata ndị mezuru na ndị bụ okwu e jiri mejuo okwu. Lee ụfọdụ n'ime ha ma were ire gị gụọ eze gị ọnụ: N'ozi afọ ọhụrụ na mbido afọ, Ụkọchukwu Ụka Katọlik a ma ama bụ Fada Ejike Mbaka kwuru na ala Naijiria ga-aba n' ihe isi ike kacha n'afọ 2021. Nke bụ eziokwu: E jighị igbo agwa ya onye ọcha n'ụdị ihe isi ike ụmụ Naijiria gabigara n'afọ 2021 dịka ọnụahịa ihe rịrị n'elu ọjị. N'okwu Coronavirus, Fada Mbaka buuru amụma na coronavirus ga-ala n'afọ 2021. Dịka o siri kwuo, n'ụka afọ ọhụrụ, Mbaka sịrị, ""A ga-esite n'afọ coronavirus juru ga n'afọ a zachapụrụ coronavirus."" Nke bụ eziokwu: Nke e mezughị . Kama mzachapụ coronavirus, nje Omicron bụ ụdị nje coronavirus a hụbeghị mbụ ma na-akpa ike karịa nke mbụ pụtara . ""Ka ọgwụ mgbochi covid-19 na-apụta, ka ụdị nje ka njọ na-apụta"" N'amụma o buru n'emume ịbanye afọ ọhụrụ, onyeisi ụlọụka Redeemed Christian Church of God bụ Pastọ Adeboye kwuru na ọrịa covid-19 agaghị ala fịam dịka ndị sayensi na-ekwe nakwa na ọgwụ mgbochi ga-ekpocha ya.. Ọ sịrị, "" Ka a na-ewepụta ọgwụ mgbọchị maka covid-19, ka ụdị nje covid-19 ọzọ na-agbakapụta"" Oge Adeboye kwuru na ọnọdụ ahụ ga-adị otua "" ruo oge onye ọbụla ga-enweta na nchekwa si n'aka Chineke."" Nke bụ eziokwu: Oge Adeboye wepụtara ozi a n'onwa Jenụwarị, ọgwụ mgbọchị covid-19 nje Omicron nke na-eyi mpaghara ụwa dị iche iche egwu apụtabeghị. Primate Babatunde Elijah Ayodele nke ụka Inri Evangelical Spiritual Church so na ndị ụkọchukwu a ma ama na Naijiria so na ndị wepụtara mgbaama ihe ndị o kwuru ga-eme n' afọ 2021. N' ọnwa Disemba afọ 2020, Primate Ayodele kwuru na na-agbanyeghị ọgwụ mgbochi coronavirus, na ọrịa ahụ ga-aga n'ihu na akpa ike n'Afrika, Yurop nakwa Amerịka. Nke bụ eziokwu: Na-agbanyeghị na e nweela ọgwụ mgbochi ọrịa malite n'ọnwa Maachị afọ 2021, ọrịa coronavirus nke nọ n'agba nke anọ ya n'ọtụtụ mba ka na-akpa ike. Ayodele kwuru na ""Ụlọakụ ụfọdụ ga-ada"" n'ihi ihe isi ike. Nke bụ eziokwu: O nweghị ụlọakụ dara n'afọ 2021 o were anya. Mwakpo ụgbọala nsonso Gọvanọ Primate Ayodele mara amụma na n'afọ 2021, na a ga-awakpo ụgbọala nsonso onye gọvanọ, ebe a ga-agbali igbu onye gọvanọ. Nke bụ eziokwu: N'ọnwa Ọktọba afọ 2021, ndị omekome a na-eche na ha bụ ndị Boko Haram wakporo ụgbọala nsonso gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum. Dịka akwụkwọ akụkọ siri kwuo, ndị agha na ndị omekome ahụ wụrụ mgbọ ihe ruru otu awa. Nke a bụ ugboro abụọ a na-awakpo Zulum bụ onye a wakpoburu n'afọ 2020. "" A ga- enwe mweghara ọchịchị na emeghi ntuliaka, onye nke abụọ ga-abụ onye mbu"" N'ọnwa Jenụwarị afọ 2021, ụkọchukwu ụka Faith on the Rock Ministry International bụ Apostle Theophilus Ebonyi, gwara ndị ntaakụkọ na Nasarawa steeti na 'a ga-enwe mgbanwe ọchịchị na-enweghị ntuliaka ọbụla, na onye nke abụọ ga-abụ onye nke mbụ."" ""Chukwu gosiri m oge m nọ n'ekpere na Naijiria ga-enwe mgbanwe etu ihe si aga na onye nke abụọ ga-abụ onye nke mbụ dịka onyenweanyị si kwuo."" Nke bụ eziokwu: Onyeisala Muhammadu Buhari ka bụ onyeisiala, Osote ya bụ Yemi Osinbajo ka bụ onye nke abụọ. E nweghị mgbanwe ọbụla n'ọchịchị. Apostle Paul Okikijesu, ụkọchukwu na-edu ụka 'Christ Apostolic Miracle Ministry' buru amụma na mbido afọ 2021 na ""Onye gọvanọ nwoke ga-anwụ, ebe osote ya bụ nwaanyị ga-eweghara ọchịchị dịka gọvanọ dịka o siri mee n'oge Jonathan na Ya'Adua."" Nke bụ Eziokwu: Ogun, Kaduna, Rivas na Enugwu Steeti bụ steeti nwere nwaanyị dịka Osote gọvanọ. O nweghị gọvanọ na-achị steeti ọbụla nwụrụ ma ya fọdụ osote ya nwaanyị iweghara ọchịchị. Apọstụl Johnson Suleman bụ ụkọchukwu na-edu ụka Omega Fire Ministries International, dị n' Auchi, Edo Steeti. N'amụma o buru n' abalị Disemba 30, afọ 2020 maka 2021, Apọstụl Suleman kwuru na Chukwu gwara ya na Osote Onyeisiala bụ Yemi Osibanjo ga-abụ onyeisiala. "" Onyenwe m gwara m, m nụ ya na ntị na 'Onye nke abụọ ga-abụ onye nke mbụ'."" Suleiman gara n'ihu buo amụma na Naijiria ga-ama jiji mana ọgaghị ekewa, nke a na-enwe agha. Nke bụ eziokwu: Buhari ka bụ onyeisiala, Osinbajo kabụkwa osote ya. E nwere ngagharịiwe na tigbuo-zogbuo ndị na-achọ nnwere onwe, mana Naijiria ekewaghị nke a na-enwe agha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59794847 +entertainment Deezell na Maryam Booth: Onye nwe ihe nkiri mgbariọtọ ha na-agbagha? Maryam Booth bụ onye na-eme ihe nkiri na Naịjirịa ama ama ekwuola ihe ọ ma maka ihe nkiri mgbarịọtọ a na-eche na ọ bụ ya na-efegharị n'elu soshal midia. O depụtara n'akara Instagram ya na ọ bụ onye bụbu ọyị ya nwoke akpọrọ Ibrahim Ahmad Rufai sere ya foto mgbarịọtọ ahụ mgbe ha na-eme enyi n'afọ atọ gara aga. Ọ kwuru na Rufai na-ana ya ego ka ọ ghara iwepụta ya bụ foto mana ọ gbagwojuru ya anya ka ya bụ foto si pụtakwazịa n'elu soshal midia. Ọsịsa ya na-abịa ka Rufai onye eji Deezell wee mara gọnahụrụ ya bụ okwu site n'idepụta ogologo okwu n'akara twitter ya. Kamgbe ahụ ndị mmadụ amanyela ọnụ n'elu soshal midia. @fag_glamour si na ihe nke a gbagojuru ya anya. @ArewaWoman kwuru na ọ bụ ọyị rara Maryam Booth nye @EagleAdekoya kwuru na onye ọbụla na-eme ọfụma ga-enweriri nkatọ. Ụmụ ụwa ka na-eche ka ha hụ ihe ọzọ ga-esi na ya bụ okwu pụta. https://www.bbc.com/igbo/afirika-51432790 +health Ovarian Cysts: Gịnị bụdị nsogbu 'ovarian cyst' ụmụnwaaanyị kpụzị n'ọnụ ugbua "'Ovarian cyst' bụ otu ọnọdụ ahụike ụmụnwaanyị ugbua na-akpụkarị n'ọnụ n'ihi egwu na o nwere ike imetụta .ọmụmụ maọbụ bute ajọ ọrịa kansa. Mana ndị ọkachamara ahụike na-ekwu na ọ bụ enweghị nghọta zuru oke mere ọnọdụ ahụ ji echụ ọtụtụ n'ime ụmụnwaanyị ụra. Ovarian cyst bụ mkpụrụ maọbụ akpụ na-adị n'akpa akwa nwaanyị. Dịka dọkịta ahụịke ụmụnwaanyị bụ Dkta Ngozi Obi siri kọwaa,""akpa akwa nwaanyị (ovaries) na-amịpụta mkpụrụ n'ọnwa ọbụla. Oge 'ovulation', ọ gbawa wepụta akwa na-agbaze ghọọ nsọ nwaanyị ma ọ bụrụ na nwaanyị ezuteghị nwoke, mana o nwere ndi anaghị agbawa"". Naanị ma mkpụrụ ahụ buwe ibu karia maọbụ ma mkpụrụ ahụ tụfikọ n'okporo ya ka o ji abụ nsogbu. Dkta Obi, onye na-arụ n'ụlọọgwu Emel Hospital dị na Festac Legọs, sịrị,""Inwe ọrịa mbute (infection) nwere ike ibute ovarian cyst"". ""Ọzọ bụ ụmụnwaanyị na-achọ nwa na-añụ ọgwụ ka ha dị ime nwere ike ibute ya"". ""Mkpụrụ ahụ nwekwara ike tụfịkọ n'okporo ya ma na-afụ nwaanyị ụfụ n'afọ."" ""Mgbe ụfọdụ mkpụrụ ahụ nwere ike ibu nnukwu ibu."" Ọ kọwara na o bukarịa setimita isii, ị mara na nnu aghala ofe, dịka o nwere ike ịdachi akpamamịrị. ""Ọ bụ ụdị mkpụrụ a ka a na-awa afọ wepụ."" E nwekwara mkpụrụ nke na-esite n'ọrịa kansa. ""Ndi kansa dị n'agbụrụ ha; kansaara."",nke kolon, nke akpa akwa wdg"". Kedụ ka ị ga-esi amara ma i nwere 'Ovarian cyst'? Ọ naghị edo anya ịmata ma nwaanyị e nwere ovarian cyst' belụsọ ma o mere nnyocha ahụ. Dkta Obi kọwara,""Ọ bụ imee nnyọcha ukwu (pelvic scan) ka ị ga-eji ama."" Mana mgbe ụfọdụ, e nwere ihe a na-ahụ anya nwere ike ịgba ama na nwaanyị nwere 'ovarian cyst' Dika Dkta Obi and websaitị medicalnewstodayi kwuo, ha gunyere: Ovarian cyst nwere ike ibute ime isi ike na nsogbu ahuike ndị ọzọ. Dkta Obi sịrị, ""O nwere ike imebi akpa akwa nke pụtara na ọ gaghị na-amị akwa. Nwaanyị enweghị akwa agaghị atụlị ime."" ""Ọ bụrụ na 'ovarian cyst' buo nnukwu ibu (ụfọdụ na-aha ka afọ ime ọnwa atọ), o nwere ike ikpagide akpa mamịrị, mee ka nwaanyị naanyụ mamịrị rinne."" ""Ọ bụrụ na o butere gị kansa, ọ ga-na eme gị ị na-ata ahụ."" ""'Ovarian cyst' nwere ike ikesa n'akụkụ ahụ ndị ọzọ."" ""O nwere ike isi n'akpa akwa gafe n'opi akwa (fallopian tubes), akpanwa nakwa ọnụ akpanwa maọbụrụ nke kansa."" Nke obere na-agbazere onwe ya mana a na-awa afọ iji wepụ mkpụrụ buru oke ibu. Mana ọ bụrụ nke kansa, Dkta Obi kwuru na ọ bụ ihe Bekee kpọrọ 'radiotherapy' maọbụ 'chemotherapy' maọbụ ha abụọ ka e ji agwọ ya. Ndị ọkachamara na-enye gị ndụmọdụ ndị a: - Na edowe onwe gị ọcha mgbe dum iji gbochie ụmụ pịrị ọrịa na-emetụta ahụnwaanyị gị. - Gba mbọ ịji okpunnabụenyi oge ịna-enwe mmekọ iji gbochịa ibute ọria nwere ike i mepere ovarian cyst ụzọ. - Ọ bụrụ n'isi n'agbụrụ ndị na-enwekarị kansa, gbaa mbọ na-eme nnyocha ahu kwa daa, iji chọpụta mgbe mmiri ruwere ma gbaa ọsọ mmiri n'oge. - Ọ bụrụ na i buru oke ibu, gbalịa ka ị talata n'ihi na oke ibu na-eme ka ọ dị mfe inwe 'ovarian cyst'."" - Ọ bụrụ na e nwee mgbanwe ọbụla na etu i si ahụ nsọ gị, gbara gaa hụ dọkịta." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57338455 +business Etu mmachi otu jikọtara ndị keke si emetụta ndị Anambra steeti "Ndị bi n'Anambra steeti gwara BBC Igbo etu mmachi gọọmentị steeti ahụ machiri keke na bọọsụ si emetụta ha. Ha kwuru na kemgbe a machiri ụgbọala ndị a, na ịgara mkpa ha na-arazị ahụ. Ebe ụfọdụ kwuru na iji naanị ụkwụ agagharị na-egbuzi ha mgbu n'ahụ, ndị ọzọ kwuru na ọ bụ ha bụ ""ụmụogbenye"" na-enweghi ụgbọala nke ha ka ọ kacha emetụta. Ndị na-anya keke ji ohere ahụ gwa gọọmentị ka ha mee ebere ma butuo ego ole gọọmentị na-ana ha n'ụtụisi. Cheta na Gọọmentị Anambra steetị depụtaburu akwụkwọ maka mmachị a na steeti ahụ, ebe ha nọ kọwaa na ihe kpatara ya bụ mmachi bụ maka etu ụfọdụ ndị otu a sị azọ ọkwa onyeisioche ga na-anakọta ego n'ọgbọ (park) ha. Nke a mere ka gọọmentị steetị ahụ machie ha ọnwa isii ruo mgbe gọọmentị ga-enyochacha ihe butere nsogbu n'etiti ha. Gọọmentị kwukwara na ndị otu a na-ebute ọgbaaghara n'obodo, ma kwuo na machi a ga-enyere ndị otu ahụ aka ịhazigharị onwe ha, họpụta ndị isi bụ nke gọomentị ga-amata dịka ndị isi ha. Gọọmentị na ndị otu a kwekọrịtaburu na ha ga-amailte ịna ụtụisi dị icheiche ma hibekwa ụsọrọ enyemaka ga-enyere nd��� ọkwọụgbọala aka, ọkachasị n'ahụike ha. Na ya bụ nkwekọrịta, ndị keke ga-amalịte ịkwụ N4,000 n'izuụka maọbụ N15,000 n'ọnwa. Ndị Keke nọ n'okpuruọchịchị asatọ ebe e nwere ọnọdụ onye apụla ezi n'abalị, ga-akwụ N3000 n'izụụka maọbụ N12,000 n'ọnwa. Ndị dị etu a ga-amalitekwa ịkwụ N4000 kwa izuụka nakwa N15,000 kwa ọnwa mgbe e wepuru ọnọdụ onye apụla ezi n'ogbe ha. Ndị bọọsụ ga-akwụwa N5000 kwa izu na N20,000 kwa ọnwa. Ndị bọọsụ ASUU ga-akwụwa N2500 kwa izu maọbụ N10,000 kwa ọnwa rụọ mgbe e mepere ụlọakwụkwọ, bụ mgbe ha ga-amalite ịkwụ N5,000 nakwa N20,000." https://www.bbc.com/igbo/articles/c840zgpzmd1o +politics Inec si na-onweghi mgbagwoju anya ọbụla di na bọjeti ha Akụkọ ndị kachasị mkpa taa: Independent electoral commission akpọrọ INEC na aha ịchafụ agọọla na-onweghị ihe nzuzo di na ego ha tinyere maka ntụlịaka 2019. Ode akwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Rotimi Oyekanmi siri na kama, onyeisiala Mohamadu Buharị kere ya bụ ego ezigara ya ụzọ abụọ maka ịwepụta ya. Okwu Restructing Igwe Alfred Nnaemeka Achebe bụ obi na ọnisha akpọọla oku ka ndị Igbo tinye ọnụ na ihazigharị obodo Naịjirịa karịa ịzọ ọkwa ọnyeisiala. O kwuru nke a n'ihụ gọvanọ plateu steti bụ Simon Lalong mgbe ọ gara ịnọnyere ndị Anambra na Jos na-emume ụbọchị omenala ha na ebe ahụ. Na mba ofesi Ndị uweojii n'obodo Florida na mba Amerika ekwuola na otu nwoke gburu mmadu abụọ na ebe a na-eme asọmpị ihe nkiri Bekee Kpọrọ Video Game. Nwoke a mechara gbuo onweya ka ndị hụrụ mgbe ihe a mere na-akọwa na ọ bụ mgbe emeriri ya ka nwoke a kopuru bịa were mgbọ sawa ndi mmadụ ahụ. Ndị merụrụ ahụ nọ ụlọụgwụ. Na egwuregwu Ndị ọkwa ha gbagotere na egwuregwu tenis ga-ezute taa na mgba Amerịka maka asọmpị akpọrọ US open na Bekee. Mmadụ dị ka Andy Murray, Serena Williams, Rafael Nadal, Stan Wawrinka na Sloane Stephens ga eso zụọ iko nke afọ a. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ụkọchukwu Jenny Kenny gwara BBC Igbo na ọ bụ chukwu kpọrọ ya oku, nke mere ya ji jiri egwu agwọ ọrịa. https://www.bbc.com/igbo/afirika-45319232 +entertainment Iri ji na mgba azụeruala Mgba a bụ ihe a ndị Igbuzo dị na Delta steeti na-eme afọ ọbụla maka nkwadebe iri ji ọhụrụ. Igbuzo na-agba mgba a otu oge n’ime afọ niile. Ndị na-eso na mgba a bụ ndị ruru bido afọ iri ruo afọ iri anọ. N’oge gboo, ha na-eji mgba a edozi esemokwu. Ha na-ejikwa mgba a ama onye kachasị ike n’obodo ahụ. Ha na-eji ohere emume ahụ ama onye ọrụugbo bụ ọkaibe n’ọrụ ya. Akụkọ ga-amasị gị https://www.bbc.com/igbo/afirika-45605869 +business Ohaji/Egbema Imo State: Obodo nwere ọtụtụ mmanụ agbidi mana okporoụzọ ha jọgburu onwe ya Nkụ dị na mba na-eghere mba nri, mana ilu a apụtaghị ihe n'ebe ndị Ohaji/Egbema nọ. Ohaji/Egbema bụ obodo dị n'Imo Steeti nke nwere ihe ọnatarachi ebe ọ dị ukwu. Mmanụ agbịdị dị n'ala ha nke ọma; ha nwekwara ikuku gaasị n'ebe o buru ibu. Ọtụtụ nnukwu ụlọọrụ a na-anụ aha ha nọkwa n'obodo ahụ n'ihi ihe akụ ọnatarachi ha nwere. Mana okporoụzọ e si aga obodo ahụ jọgburu onwe ya. Lee ihe BBC Igbo hụrụ oge anyị gara Ohaji/Egbema. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58418214 +entertainment Igbo Traditional musical instruments: Etu m si mụta ịkpọ ụbọ aka - Oluomachukwu Odimegwu Ụbọ aka bụ otu n'ime ngwa egwu ndị Igbo e kwuru na-alazị ala n'ihi enweghi ọtụtụ ndị ma akpọ ya ọfụma. Mana Oluomachi Odimegwu, nwatakịrị dị naanị afọ 15, ma etu e si akpọ ya ka ọ tọba gị n'ụmị. Odimegwu bụ onye Ihiala dị n'Anambra steeti, gwara BBC Igbo etu o si mụta ịkpọ ya bụ ụbọ aka nakwa etu ịkpọ ya si enyere ya aka ịghọta omenala Igbo ọfụma. Ọ gara n'ihu kwuo etu o si dị oke mkpa na ndị ọgbọ ya na ndị ntorobịa mụtara etu e si akpọ maọbụ akụ ngwa egwu Igbo ndị ọzọ e nwere. Odimegwu jikwa ohere a foo akụkọ ifo nke o ji ịkpọ ụbọaka ya kwado. Nwanne ya nwaanyị na-afụkwa ọja sonyekwara ya. Ngwa kirie ya ka ihu bụrụ gị sọsọ ọchị. https://www.bbc.com/igbo/afirika-60725751 +entertainment Atara m ahụhụ tupu mụ na Zoro, Kizz Daniel, Sakordie na ndị ọzọ malite ọrụ - Kemzart Adiukwu Daniel Nkemakolam ama dịka Kemzart akụwala akụoyibo nsugbe gbasara mmasị o nwere n'ọrụ ya. O meerela ndị a ma ama dịka Zoro, Rudeboy, King Perry na Kizz Daniel ihe onyonyo. Ọ kọwara etu mmasị o nwere n'ọrụ a si duru ya bata Legọs ma na-eme ọfụma n'ọrụ aka ya. Kirie onyonyo ya n'uju n'elu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58261280 +sports Golden Eaglets na nnụnụ ndị ọzọ feterela Naịjirịa ntụrụugo na bọọlụ "N'ihi na egwuregwu bọọlụ so n'otu ihe na-ejikọ ndị agbụrụ Naịjirịa niile, ọ pụtara na njikọ ahụ na-akacha mma mgbe ihe nrite so ya. A bịa n'ihe gbasara egwuregwu, ndị Naịjiria anaghị eji ya achị, nke bụ na e nwere ike too gị ka dike taa, mana echi ị bụrụ 'onye chi ọjọọ' nye ha, ọkachasị ma a hụta na ị metara ihe e ji gbapụ Naịjirịa n'asọmpi. Mana n'ime ihe niile, enweghị ihe na-atọ ndị Naịjirịa ụtọ dịka mmeri, ọkachasị mgbe ọ bụ na mba. Ngwa lee ka ịhụ etu BBC Igbo si chịkọta otu egwuregwu bọolụ Naịjirịa ndị kacharala bulie iko asọmpi, ole ha nweterela na mgbe ha nwetara ha. A bịa na Naịjirịa, ndị a ma dịka ""Golden Eaglets"" bụ ndị ọgbabọọlụ na-akarịghị afọ 17, bụ ndị kacharala metụ iko asọmpi bọọlụ aka. Ha ebuliela iko ugboro asatọ (8); gụnyere iko mbaụwa ise (5), iko mba Afrịka abụọ (2) nakwa otu iko UEFA-CAF Meridian (1) bụ nke ha buliri n'afọ 1997. Ha buliri nke mbaụwa n'afọ 1985, 1993, 2007, 2013 na 2015. Ha buliri nke mpaghara Afrịka n'afọ 2001 na 2007. Ndị ""Dream Team"" bụ ndị na-akarịghị afọ 23 (a na-enye ohere ịkpọ mmadụ atọ karịrị afọ 23), ma bụrụkwa otu Naịjirịa na-akpọ aga asọmpi Olimpiks. Dream Team ritere ọlaedo n'afọ 1996, ọlaọcha n'afọ 2008, ma rite ọlanchara n'afọ 2016. Nke a mere ka Naịjirịa bụrụ mba mbụ si mpaghara Afrịka nweterela ọla atọ a na-enye n'asọmpi bọọlụ nke Olimpiks. Ha mabutekwara iko mpaghara Afrịka n'afọ 2015. Ndị Super Falcons so na ndị kacha etinye ọchị n'ọnụ ndị Naịjirịa ma a bịa n'egwuregwu. Ha amaburula Iko mpaghara Afrịka ugboro itoolu (9) kemgbe ha malitere isonye n'asọmpi a. Ha buliri Iko Mpaghara Afrịka n'afọ 1991, 1995 mgbe ọ ka bụ asọmpi egwuregwu ụmụnwaanyị Afrịka nke CAF (CAF African Women's Championship). Mgbe a malitere ịkpọ ya Africa Women Cup Of Nations (AWCON) ha buliri iko a n'afọ 1998, 2000, 2002, 2004, 2006, 2010, 2014, 2016 nakwa 2018. Ha ebulikwaala iko WAFU Zone B n'afọ 2019. Ha enwetakwala ọlaedo n'asọmpi All Afrịca Games ugboro abụọ, 2003 na 2007. A bịa n'egwuregwu na Naịjirịa, ọ na-adị ka ọ bụ nke ndị Super Eagles na-akacha amasị ndị Naịjirịa itinye anya ma na-esokwa. Ya bụ nke na-akacha ewu, makana ọ bụ ha bụ nke onye ọbụla ga-esonyenwu n'agbanyeghị afọ ole ọbụla ị dị; nke bụ na ị ga-enwe ohere ịhụ ndị ị na-akwado n'egwuregwu nke klọb. Super Eagles ebuola Iko mpaghara Afrịka ugboro atọ; n'afọ 1980, 1994 nakwa 2013. Ha ebulikwaala Iko nke a na-akpọ ""WAFU Nations Cup"" bụ maka mba ndị si mpaghara ọdịda-anyanwụ Afrịka n'afọ 2010. Flying Eagles bụ ndị nke na-akarịghị afọ 20 na-agbara Naịjirịa bọọlụ. Ha ebuliele iko mba Afrịka ugboro asaa; n'afọ 1980, 1985, 1989, 2005, 2011 nakwa 2015. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50227966 +business World Braille Day: 'Abara m n'ọrụ nkuzi maka na ugwu adịghị n'ịrịọ arịrịọ' Onye nkuzi a kpọrọ Ofejebe Tochukwu gwara BBC Igbo na ọnọdụ ya dịka onye kpuruisi egbochighi ya ime ihe na-amasị ya bụ ịkuzi ihe. Tochukwu gbara ndị nọ n'ụdị ọnọdụ a ume, ka ha hapụ ịrịọ arịrịọ kama chọọ otu ihe ha ga na-eme iji nyere onwe ha aka. Kirie ihe ajụjụ ọnụ ya n'uju: Onye mere akụkọ a: Chris Sanctus Chukwudi Okereke, Chimezie Ucheagbo https://www.bbc.com/igbo/afirika-46419968 +business Bank robbery: Ndị ojiegbeezu awakpoola ụlọakụ n'ehihie na abọ mụ anya "Ndi uweojii Ondo steeti ekwuola na ha kụrụ ndị ojiegbeezu wakporo otu ụlọakụ dị n'Iju n' okpuru ọchịchị Akure-North n'Ondo steeti n'ehihie Tuzde njọ ahịa dịka o nweghị ihe ha zutere. Mana ndị omekome ahụ gburu otu onye ọrụ ụlọakụ ahụ, ebe ụfọdụ ndị mmadụ merụrụ ahụ n'ọgbaghara dapụtara ka ndị ekperima ahụ wụchiri ụlọakụ ahụ wụwa mgbọ n'ehihie na abọ mụ anya. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Femi Joseph gwara BBC Igbo na ""o nweghị ihe ha zutere."" O kwuru na ndị ọrụ ha nwetara ozi na ndị omekome zọchiri n'ụlọakụ ahụ, ma zaa oku a kpọrọ ha ngwangwa. Joseph, onye gbara ama na mkpọ tụrụ otu onye n'ime ndị omekome ahụ oge ha na ndị uweojii na-akwarịta mgbọ kwuru na ndị ekpereima ahụ ghaara ụgbọala abụọ ha jiri bịa ije ọjọọ ahụ, gbalaga. Ọ gara n'ihu kwuo na ka ọ dị ugbua, ndị uweojii na-esi imi n'ala inweta ndị nyụrụ ihe na-esi ebe ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49254836 +politics Mohamed Morsi: aka chịbụrụ Egypt anwụọla ka ọ dara n'ụlọikpe "Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na sị na Mohammed Morsi bụbụ aka na'achị mba Ijipt nara mụọ n'ụlọikpe na Kaịro bụ isi obodo mba ahụ ka ọ gara ụlọikpe dịka ndị ọrụ nchekwa n'ikpe siri kwuo. otu onye na-arụ ọrọ n'ụlọ ikpe sị: ""Ọ na-agwa ọkaikpe okwu tupu ọ daa. E buru ya gawa ụlọ ọgwụ bụ ebe ọ nọ nwụọ,"" Morsi bụ onye mbụ ritere ọchịchị n'ọnọdụ onye kwuo uche ya. Ọ nọrọ otu afọ n'ọkwa tupu ndị agha chutuo ya n'afọ 2013 ka ọgbaghara dara na mba ahụ. Morsi nọ mkpọrọ kemgbe a mara ya ikpe maka ndị nwụrụ n'ọgbaghara eji wepụ ya n'ọkwa. Gọọmentị Ijipt ji aka ike sowe ndị na-akwado Morsi nakwa ndị otu Alakọba akpọrọ ""Muslim Brotherhood"", bụ ndị o si n'okpuru ha nwete ọchịchị. Ikpe a na-ekpe Morsi tupu ọ nwụọ bụ nke metụtara ebubo na aka ya dị n'ime ịgba ama a sị otu Hamas nkle Palestine mere n'Ijipt. A mụrụ Morsi na obodo El-Adwah dị na Mpahra ""Nile Delta"" nke Sharqiya n'afọ 1951. Ọ gụrụ Nka na Mahadụm Kaịro tupu ọ ga mba Amerịka ga gụọ ọkamụta. Otu Muslim Britherhood hopụtara ya ka ọzọ ọchịchi dịka onyeisiala n'afọ 2012 ka a manyere onye ha chọrọ ka ọ pụọ. Ka o meriri, o kwere nkwa na ya ga achị ndi Ijipt niile. Ọtụtụ ndị akwadoghi ya sị na-omezughi nkwa ya n'ime otu afọ a ọ chịrị Ijipt. Ndi mmadu banyere ọzọ ịsị ya rituo n'ụbọchị o mere otu afọ n'ọchịchị n'ụbọchị Juun 30 nke 2013. Na mgbede Julaị 3, ndi agha wezugara iwu ji mba Ijipt ma kwuo na ha enwela gọọmentị ọzọ. Morsi si na ekweghi na nke a. Ndị agha nwụchịrị ya were tuba ya na mkpọrọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-48665068 +entertainment """Ịgba egwu Salsa zọrọ ndụ m"" - Emeka Adindu" "Onye nkuzi egwu Salsa bụ Emeka Adindu agwaala BBC Igbo etu egwu Salsa si zọ ndụ ya. O kwuru na ọ bụ mmetọ n'ụzọ mmekọ ahụ ọ gabigara mgbe ọ bụ nwata mere ka o malite ịche echiche ịgbu onwe ya ka o ji gbakwuru Salsa. ""A chọrọ m ịkọ akụkọ m ka ndị nne na nna anyị were mụta akọ n'ebe ụmụaka ha nọ"" ka o kwuru. Ugbua o kwuru na o ji akara aka a enyere ndị ọzọ obi ha na-ada mba aka. Lee ihe niile o kwuru n'ime ihe onyonyo a. Akụkọ a si n'aka Jessica Nwankwo na Vining Ogu." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51385104 +entertainment Lee nwaanyị ji ịgba egwu agbanwe ndụ ụmụaka enweghi ebe obibi Ihe ruru ụmụaka nde iri na ụma ise anaghị agụ akwụkwọ na Naịjirịa maka ụbịam, nke so n’ọnụọgụgụ kachasị na mbaụwa niile, dịka ụlọọrụ World Bank si kwuo. Ụbịam anapụla ọtụtụ ụmụaka na-awụgharị n’ụzọ ohere ịbụ ihe ha kwesịrị ịbụ na ndụ ha. World Bank kwuru na nke a sokwa n'ihe na-eme ka mpụ, ohi na ihe ọjọọ ndị ọzọ na-arị elu n’obodo. Ihuoma Harrison bụbu otu nwata ndị a ụbịam metụtara n’ụzọ ọjọọ mana ugbua, ọ tụgharịala malite inye ụmụaka dị ka ya enyemaka, ịgbanwe ndụ ha site n’ikuziri ha egwu na nka. Nne na nna Harrison nwụrụ mgbe ọ ka bụ obere nwa mana ọ gbara mbọ zụlite onwe ya ruo na ngwụcha Mahadum ma zụkwaa ụmụnne nke ya site n'aka ọrụ ya. Ọ kọwara etu o si laghachi n'ime obodo inye ụmụaka enweghi ebe obibi enyemaka nakwa ịkwụ ụgwọ akwụkwọ ha site n'otu nka ahụ ọ na-eme. Gee ihe o kwuru n'uju ebe a.: https://www.bbc.com/igbo/articles/crgn80px39no +politics Osun governorship election: Lee ndị na-azọ ọkwa gọvanọ Osun steeti Dịka ndị Osun steeti na-azọ ọkwa gọvanọ, lee ndị na-azọ ya bụ ọkwa na pati ha si azọ. Pịa aka n'aha ha ka ị hụ ihe ị kwesịrị ịma gbasara ha. https://www.bbc.com/igbo/afirika-62168872 +entertainment Moses Ebere, onye mmepụta ejije Nollywood a ma ama alaala mụọ "Otu onye katara ahụ n'imepụta ejije na Nollywood bụ Moses Ebere, anwụọla. Dịka ogbo ya bụ Sunny Mac Don, si gwa BBC Igbo n'ekwentị, Ebere, onye nwe ụlọọrụ mmepụta ihe ejije a kpọrọ, 'Aim and See Entertainment', nwụrụ abalị abụọ gara aga nke bụ ụbọchị Tuzde. Macdon gara n'ihu kwuo, "" Ọ yaghị ahụ, ọ nabara ụra mana o teteghị."" Akụkọ ka na-abịa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60861614 +health Coronavirus update: Gịnị bụ 'herd immunity'? Nkọwa ihe 'herd immunity' pụtara. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52724621 +politics Nke bụ eziokwu maka ndị Ekperima na-abata Anambara - Gọọmentị Anambara """O nweghị ndị ntorobịa si mpaghara Ugwu Naịjirịa na-awụbata n'Anambara steeti, ya bụ akụkọ bụ okpotokpo asị"" Onye kwuru nke a bụ Don Adinuba, kọmishọna mgbasaozi Anambra steeti. Adinuba gwara BBC na ndị ọrụ nchekwa niile, ma ndị uweojii, ndị DSS, ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ (road safety), kwuru na o nweghị ihe dị otu ahụ. Ọ dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ zeere akụkọ ụgha na-enweghị isi na ọdụ. Adinuba kwuru na ọ bụ ndị Igbo ka nọrọ na mpaghara Ugwu Naịjirịa karịa ndị Awụsa nọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ. O kwukwara na ndị Igbo bi Ugwu Awụsa ka nwee akaọrụ dị mma, karakwa baa ọgaranya karịa ndị Awụsa bi n'ala Igbo. Nke a pụtara na ọ bụ ndị Igbo ka ọ ga-aka metụta ma ọgbaaghara daa. Ndị uweojii sị na ha na-eme nnyocha banyere okwu a Oge BBC kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Haruna Mohammed, o kwuru na ya bụ okwu erijuchghị afọ, mana ha na-enyocha ya. Cheta na onyeisi otu nche 'Anambra Vigilante Group', Ikechukwu Aduba, kwuru na ndị mmadụ wetara mkpesa na si ""ndị awụsa na-enubata n'Amawbia, Neni, Nise, Agulu, Ekwulobịa nakwa obodo ndị ọzọ n'Anambra"". Aduba onye jibu ọkwa Kọmishọna ndị uweojii, kpọkuru ndị ọrụ nchekwa dị icheiche ka ha saa anya mmiri iji gbochie ọdachi ọbụla. Mana Haruna Mohammed kwuru na o nweghị ihe akaebe ọbụla gosiri na ndị ekperima si mpaghara Ugwu awụbata n'Anambra. N'agbanyeghị nke a, Haruna kwuru na nnyocha amalitela dịka Aduba si rịọ, iji mata nke bụ eziokwu. Ọ gara n'ihu rịọ ndị mmadụ ka ya bụ akụkọ ghara ichu ha ụra chaachaa. Otu onye bi n'Agulu aha ya bụ Emmanuel Offor gwara BBC na onwebeghị ihe dị iche ya hụrụ n'okirikiri ebe ahụ. O kwuru sị: ""O nwebeghị ihe dị otu a m hụrụ maọbụ nụ na ntị"" ""Ana m aga Awka, Nwaagu na Ekwulobia oge ọbụla, mana onwebeghi ihe m hụrụ. Egwu ọbụla anaghịkwanụ atụ ndị mmadụ ebe a."" Onye ọzọ anyị na ya kpara nkata kwuru na ọ bụ na redio ka ya nụrụ ebe otu ụkọchukwu ndị ụka Anglican na-ekwu ihe gbasara ya. Mana ya ahụbeghi ihe dị otu ahụ n'okirikiri ebe o bi. Akụkọ gbasara mbata ndị Ugwu n'Anambara malitere ifesa oge otu onye tinyere ihe onyonyo na soshal midia. O kwuru na ya hụrụ ndị Awụsa ruru narị anọ ka ha gbakọrọ n'otu ebe a kpọrọ 'Ama Awụsa' n'Amawbia, si ebe ahụ na-abanye obodo ndị ọzọ dị iche iche. O gosikwara ndị nọ n'elu ọgbatumtum, bụ ndị ọ sị na ha bụ ndị Awụsa na-abanye obodo dị icheiche. Onyeisi ndị otu 'Indigenous People of Biafra' bụ Nnamdi Kanu, ji ya bụ ihe onyonyo mee mgbasaozi ya na Facebook na-ekwu na ndị Fulani na-akwado ịwakpo ala Igbo. Mana Don Adinuba kwuru na ya bụ ihe onyonyoo enweghị isi. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-54114853 +health Etu e si zọpụta nwa m a mụrụ ka afọ ime m dị izuụka 24 - Ogubuike Ihe nwaanyị kwesịrị ibu afọ ime tupu ọ mụọ ya bụ izuụka iri atọ na asaa (37 weeks) ruo izuụka iri anọ (40 weeks). Mana Chioma Ogubuike mụrụ nwa ya oge afọ ime ya dị naanị izuụka iri abụo na anọ (24 weeks), nke pụtara na nwa ahụ akabeghi aka chaa chaa tupu a mụpụta ya. Ndị dọkịta kwuru na ya bụ nwa agaghị adị ndụ, mana dịka Pantaleon Ogubuike bụ nna nwata ahụ si kọọrọ BBC Igbo, nwa ya nwoke dị ndụ ugbua ma nwee ahụ ike. Ogubuike kọrọ etu o si buru nwa ya kpagharịa ọtụtụ ụlọọgwụ n'Owere, Imo steeti, ihe ruru awa atọ tupu ọ hụ ụlọọgwụ nke nabatara ha ma malite inye nwa ya ọgwụgwọ. Ụlọọgwụ ebe a nọ leta nwata a bụ 'Cradle and Mums Specialist Hospital' nke dị na mpaghara 'New Owerri'. N'ezie, mbọ a gbara iji zọpụta nwata ahụ dịka mmadụ ịga gụta ọkụ na be ndị mmụọ, mana e mechara, zọta nwata ahụ ndụ. Dọkịnta Chinwe Muomalu, onye nwe ụlọọgwụ ahụ, kwuru na Naịjirịa nwere nnukwu ọnụ ọgụgụ ụmụ nwaanyị na-amụ nwa na-akaghị aka. Naịjirịa bụ mba nke abụọ ebe ụdị ihe a kacha eme. Mba nke mbụ bụ India. Dkt Muomalu kọrọ ihe niile ha mere iji zọọ nwatakịrị ahụ ndụ; o kwukwara na akụrụngwa e ji eleta ụmụaka a mụrụ ọhụrụ abụghị ihe obere ego. Ya mere o ji dị mkpa na gọọmentị ga-akpọ ya mkpa ma mee ka ụlọọgwụ niile nwee akụrụngwa ndị a. Kirie akụkọ a na-awụ akpata oyi n'ihe onyonyo dị n'elu. Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi na Vining Ogu. https://www.bbc.com/igbo/articles/c875zxlp1j0o +politics Ibrahim Badamasi Babangida: Ihe i kwesịrị ịma maka ya Ibrahim Badamasị Babangida bụ otu n'ime ndị ọchịagha chịrị Naịjirịa nke ugboro asatọ site n'afọ 1985 ruo n'afọ 1993. A mụrụ Babangida n'obodo Minna dị na Niger Steeti n'afọ 1941 n'ime ezinaụlọ nne na nna ya bụ Muhammad na Aisha Babangida. Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị n'afọ 1950 ruo 1956, gụọ nke sekọndịrị na Government College Bida site n'afọ 1957 ruo 1962. Ọ banyere n'ọrụ ndịagha Naịjirịa n'ọnwa Disemba afọ 1962, mgbe ọ gara ọzụzụ na Nigerian Military Training College dị na Kaduna. Ọ natara ọzụzụ ndịagha na mba India nakwa na Briten. Babangida so na nnapụ ọchịchị n'ike e mere n'afọ 1966 nke mere e ji chụpụ ọchịagha Aguiyi Ironsi ma were ọchịagha Yakubu Gowon dochie ya. Babangida so na ndịagha Naịjirịa buru agha megide ndị Biafra site n'afọ 1967 ruo n'afọ 1970 mgbe ọ bụ onye ndu ndịagha 'Infantry Battalion' n'afọ 1968. N'afọ 1969 a gbara ya egbe n'akụkụ obi, mgbe agha na-ada n'etiti Enugwu na Umuahia mana ọ mechara gbakee. Ọ lụrụ nwunye ya bụ Maryam King n'ụbọchị isii nke ọnwa Sepụtemba, afọ 1969. Mgbe agha biri n'afọ 1970, e buliri Babangida n'ọkwa ugboro abụọ ma ziga ya na Nigerian Defence Academy dịka onye ntuziaka. Ọ gara ọzụzụ na mba Amerịka site n'ọnwa Ọgọọstụ afọ 1972 ruo ọnwa Juun afọ 1973. Babangida nwetere mbuli elu n'ọkwa nakwa ọzụzụ dị iche iche site n'afọ 1973 ruo 1985. N'afọ 1975 mgbe Babangide ji ọkwa onye ndu ndị a kpọrọ 'amoured corps', o tinyere aka napụ ọchịchị n'ike. Mana n'afọ 1976, o gbochiri atụmatụ nnapụ ọchịchị n'ike site n'ịkpa ụlọ mgbasaozi Radio Naịjirịa, nke mere e jiri gbuo ọchịagha Murtala Muhammed. N'afọ 1983, ọ haziri nnapụ ọchịchị n'ike site n'aka ndị nkịtị ma tinye n'aka ndịagha nke tinyere ọchịagha Muhammadu Buhari n'ọchịchị. Mgbe e ruru afọ 1985, ọ hazi kwara nnapụ ọchịchị n'ike n'aka ọchịagha Buhari ma tinye onwe ya dịka ọchịagha na-achị Naịjirịa. N'ọtụtụ oge mgbe Babangida nọ n'ọchịchị, ọ nwara ịhazi ntuliaka iji nyeghachị ndị nkịtị ọchịchị mana ọ dabaghị. E ruru n'ọnwa Juun, afọ 1993, e mere ntuliaka ịhọpụta onyeisiala, mana ọ kagburu ya sị na e nwere nrụrụaka. Nke a butere ọtụtụ ngagharịiwe banyere ọgbaghara na mpaghara Ndịda Anyanwụ Naịjirịa. N'ihi ọgbaghara ahụ kawanyere njọ mere ka Babangida gbaa arụkwaghịm n'ọnwa Ọgọọstụ 1993 ma nyefee Ernest Shonekan ọchịchị nchere oge. Dịka ọnwa ole na ole gachara, ọchịagha Sani Abacha napụrụ Shonekan ọchịchị ahụ n'ike. Ọchịagha Ibrahim Babangida lụrụ nwunye ya bụ Maryam n'afọ 1969 mana ọ nwụrụ n'afọ 2009. Ha mụrụ ụmụa anọ gụnyere Aisha, Muhammad, Aminu na Halima. https://www.bbc.com/igbo/afirika-60198110 +health What is 420 celebration: Lee ihe mere 420 jị bụrụ akara dị mkpa maka ndị na-ese 'marijuana' "Ị lee anya na soshal midia taa bụ ụbọchị 20 nke ọnwa Eprel, ị ga-ahụ na akara '420' na-efegharị, lee ihe kpatara nke a. Dịka taa bụ ụbọchị 20 nke ọnwa anọ bụ nke ndepụta akara ya bụ 420, ọtụtụ mba dị ịcheịche na-eme ihe omenala ncheta ahịhịa marijuana nke anyị ma dịka igbó. Ihe a malitere dịka ndị enyi ise na mba California maliter ịgbakọ ma o were nkeji iri abụọ gafee elekere anọ nke mgbede ụbọchị ọbụla, ma na-achọ ebe ha ga-ese 'marijuana'. Aha mmadụ ise a bụ Steve Capper, Dave Reddix, Jeffrey Noel, Larry Schwartz, and Mark Gravich. Ha bụ ụmụakwụkwọ oge ha malitere ime nke a. Cheta na ọtụtụ ndị nnyocha sayensị na-ekwu na ahịhịa 'marijuana' nwere ọtụtụ akụrụngwa na-edozi ahụ ma na-agwọ ọrịa n'ime ya. Mana ọtụtụ mba ụwa dị icheiche machiri 'marijuana' dịka ọgwụ ike. Naịjirịa so na mba dị otu a. Ugbua, dịka akara 420 na-efesa, ọtụtụ otu na-alụ ọgụ ikike dịrị mmadụ na mba dị iche iche jizị ụbọchị a eme ngagharị iji kpọkuo gọọmentị ka e bulie mmachị a machịrị ọgwụike marijuana na mba ha. Emume 420 nke afọ a ga-adị n'obodo Denver nke dị na steeti Colorado na mba Amerịka. Colorado bụ steeti mbụ na mba Amerịka buliri mmachị ise 'marijuana' Ndị na-ese ihe osise hụtara nke a dịka nnukwu mmeri nyere mbọ ha na-agba ka ewepụ mmachị a machiri ise anwụrụ. Ahịhịa 'marijuana' maọbụ 'cannabis' nke e ji Igbó mara na Naịjirịa, so na otu n'ime ọgwụ ike nke gọọmentị Naịjirịa machiri amachi. Mana nke a egbochighi ọtụtụ ndị mmadụ ịse ya, ọkachasị ndị ntorobịa. Ọ bụ eziokwu na ndị nnyocha sayensị na-ekwu na ahịhịa 'marijuana' nwere uru ọ bara maka ahụike, mana o nwekwara ọtụtụ ọghọm nke mere gọọmentị ji machie ya. Ahịhịa 'marijuana' nwereike inyere mmadụ aka n'ọtụtụ ụzọ ọkachasị ndị na-arịa ụfọdụ ọrịa. Enyemaka a gụnyere: ""Ibelata ahụ mgbu, ịbelata ọnọdụ ahụike na-emetụta ụbụrụ isi mmadụ maọbụ ""multiple sclerosis"" na Bekee, ibelata oke ịgbọ agbọ, ịkwụsịlata oke ụjọ na obi mmapụ, nakwa inyere ndị nwere ọrịa kansa aka."" Onye kwuru nke a bụ okammụta Makuochi Muobike, bụ ọkachamara n'ọgwụ nakwa ịmepụta ọgwụ. Muobike gwara BBC Igbo na ""'marijuana' nwere ike inye aka ka agụụ gụọ mmadụ, ọkachasị onye ahụ na-arịa"". O kwukwara na a na-eji ya enyere ndị nwere ihe Bekee na-akpọ ""post-traumatic stress disorder"" nakwa ọrịa parkinson' aka. Dọkịta ọzọ aha ya bụ Udodi Okoli kwuru na 'marijuana' na-enyere ndị na-enwe nsogbu ihi ụra aka ka ha rarụ ụra nke ọma. Kama ọ dọrọ aka na ntị na ọ bụ dọkịta kwesịrị ịgwa mmadụ ụzọ ka mma ọ ga-esi jiri 'marijuana' mee ihe, ""ọ bụghị ihe mmadụ na-aṅụrụ onwe ya aghara aghara ""Agbanyeghi na 'marijuana' nwere ọtụtụ uru, ọ naghi abụ ọgwụ mbụ maọbụ nke abụọ a na-enye onye ọrịa n'ihi ọghọm dị n'ịṅụfe ya oke,""dọkịta Okoli kwuru. Kedụ ọghọm dị na mmadụ ịse Igbó maọbụ itinye ya na nri? Otu nwoke na-achọghị ka akpọ aha ya kwuru na ịse Igbo na-enyere ya aka n'ikpalite mmụọ ya nakwa na-iralarụ ụra nke ọma. Otu nwaanyị na-achọghị ka akpọ aha ya kwuru na enyochapụtara ọgwụike a n'ahụ ya n'ụlọọrụ ya, nke mere e ji chụọ ya n'ọrụ n'ihi na ọ bụ ihe ụlọọrụ ha machiri amachi. Onye ọzọkwa sị ka a kpọọ ya John kwuru na Igbo na-enyere ya aka ịkpalite agụụ iri nri n'ihi na ọ naghi enwe mmasi rie nri. John kwukwara na ""Igbo na-enyere m aka n'ịchepụta echiche ọma n'ọrụ aka dịka onye ọkwa nka."" Nwaokorobịa ọzọ kwuru na ọ na ese Igbo iji bụ ihe na-enyere ya aka imesapụ ahụ n'ihi na ọ bụ onye ihere. O kwukwara na ụtọ Igbo abaala ya n'ụmị nke bụ na ọ ga-esiri ya ike ịkwụsị. Nke a ebuterela ya na ndị ezinụlọ ya nsogbu n'ihi na nne ya achọghị ka ọ na-ese ya. Ngalaba NDLEA bụ ndị na-ahụ maka mgbochi ịṅụ na ibughari ọgwụ ike bekee kpọrọ 'narcotics' na Naịjirịa. Ntaramahụhụ dịịrị onye a hụrụ ọgwụ ike dịka 'marijuana' n'aka ya bụ na onye ahụ ga-aga mkpọrọ ihe dịka afọ iri na abụọ. Ọ bụrụ na ọgwụ a hụrụ n'aka onye ahụ buru ibu, o nwereike ịga nga mkpụrụ ọka. Ọ bụ ezie na ọtụtụ mmadụ na mba ofesi na-agba mbọ ka a kagbuo mmachị 'marijuana', gọọmentị Naịjirịa ka kwusoro ike na ya bụ ahịhịa megidere iwu. Agbanyeghi na ụfọdụ ndị ahụike ka na-eme ndọrọndọrọ ma ọgwụ a enwereike ịtọ kụrụ mmadụ tọfee ya uche, ọtụtụ akwụkwọ ahụike agbaala ama na ụtọ ọgwụ a nwereike ịba mmadụ n'akwara nke bụ na onye ahụ aghaghị enwe ike kwụsị ịṅụ ya maọbụ see ya. Onye nọ n'ọnọdụ a nwereike ịnata ọgwụgwụ site n'aka ndị ọrụ ahụike na-ahu maka akparamagwa. E nwere ụfọdụ usoro ọgwụgwọ a na-eji enyere ndị a aka nke gụnyere: Ha niile nakwa ndị ọzọ bụ usoro eji azọpụta ndị ịse ọgwụ a na-eme ịwa. Marakwa na onye nọ n'ọnọdụ a abụghị onye e kwesịrị ịchị ọchị maọbụ kwaa emo, kama ọ bụ onye e kwesịrị iji ịhụnanya na ọmịiko nyere aka. Lekwa ụfọdụ ihe onye nwere mmasị ibelata ise maọbụ ịkwụsị ise ọgwụ a ga-eme:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-60325731 +entertainment Gorilla glue girl video: Tessica Brown agaala ụlọọgwu ebe a ga-ewepụ 'packing gel' o ji nyaa onwe ya n'isi "Tessica Brown agaala ọtụtụ ụlọọgwụ mana oweghị nke nwereike ịwepụ gel o ji nyachie 'packing gel' ya ruo ugbua. O wepụtara onyonyo gosiri ebe ọ na-egosi ahụ ụfụ mgbe a na-agba mbọ iwepụ ya bụ gel n'isi ya. Etu ihe si kwụrụ ugbua, Brown agwaala ndị nso nso ya na ọ na-aga ụlọọgwụ iwa ahụ maka ọnọdụ isi ya. Cheta na nwaanyị a si Louisiana dị n'Amerịka nweteburu onwe ya n'ụlọọgwụ ka o ji ihe nyachị akpọrọ ""Gorilla glue spray adhesive"" mee isi kama ijiri ụdị nke a ma ama eji eme isi. Nsogbu Tessica Brown wuru ewu na soshal midia na mbido February ka o kwuru na o buola otu ụzọ isi ruo otu ọnwa makana o ji ihe nyachị tara akpụ mee isi ya ka nke o ji emebụ isi gwụchara. Brown kwuru na ọ saala isi ya ugboro iri na ise mana ihe nyachị ahụ ekweghị asachapụ. Ụlọọrụ Gorilla Glue depụtara na webụsaiti ha na ihe nyachị ahụ bụ nke siri ike ukwu nakwa e ji ya anyachị 'tiles' dị ebe a na-asa ahụ, ala na elu ụlọ. Ọ bụ naanị mmanya na-aba n'anya nakwa Isopropyl were ike ịsachapụ ya Ụlọọrụ Gorilla Glue zigara nwaada a ozi nkasiobi n'ọba ozi twitter ya. Tessica gwakwara ndị mmadụ ka ha na-ekpere ya ekpere maka ihe ọ na-agabiga ugbua n'isi ya. Ihe ụlọọrụ Gorilla Glue kwuru maka ọnọdụ Brown Ha na-ekwusi ike na ihe nyachị ahụ abụghị maka ntụtụ isi makana ọ naghị apụ apụ ma ọ nyado ma na-egosi anụrị ha na Brown na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ. Ha gwara ndị na-azụ ahia ha na ha gụọ ịdọ aka na ntị edere n'ahụ ngwa ahịa ha tupu ha egoro ya. Gịnị na-emezi ugbua? Ụlọọrụ mgbasa ozi TMZ kwuru na Brown na-emete Tik Tok ọfụma ka bukwa isi ya ahụ bekee kpọrọ 'parking gel' ruo ugbua. N'ozi ha, ogbugbu ụlọrụ GG wetere enyereghị Brown aka nke mere na ọ na-achọ ikpọpụ ụlọọrụ ahụ pụwa ụloikpe. Ndị nọketere Brown gwara TMZ na ọ bụ elekere iri abụọ (22 hours) ka Brown nọọ n'ụlọọgwụ nke juru ndị nọọsụ anya , mbọ niile agbara iwepụ ihe nyachị ahụ tara akpụ kpụrụ afọ n'ala. Brown esila na ntụkọta ego GoFundMe ruru $9,000 ma na -aga kwa n'ihu kwụọ ụfọdụ ụgwọ ụlọọgwụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-55985687 +politics Ike Ekweremadu atụọla ụkwụ na Naịjirịa Sịnetọ Ike Ekweremadu alọtala na Naịjirịa ka ndị Ipob wakpochara ya n'obodo Jamini n'ụbọchị Satode n'ebe a na-eri ji. Sịnetọ Ekweremadu gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ụfọdụ ndị kpara ajọ agwa a. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya agbagharala ha. Cheta na ọ bụ n'obodo Nuremberg ebe otu Ndi Igbo Germany na-eme emume iri iji ha nke a kpọrọ Ekweremadu oku dịka onyeisioche. N'akụkọ yiri ibe ya,otu Ndị Igbo Jamini akatọọla agwa Ipob kpasịrị Sinetọ Ike Ekweremadu mgbe ọ bịara iri ji n'obodo Nuremberg ụbọchị Satọde N'ozi si n'aka onyeisi ha bụ Ozofor Ogechukwu, ha rịọrọ Ike Ekweremadu mgbaghara ma kwuo na Ipob ga-atakụta ya aja maka ihe ha mere. N'otu aka ahụ, ụlọ ọrụ na ahu maka mkpo Jamini na Naịjirịa ekwuola na ndị kpara mkpa mkpa ga-ezute iwu mba ahụ. Nke a mere ka Ipob na ekwu na ha ka ga-eme ọzọ. Ngagharịiwe 'RevolutionNow' Otu kpọrọ onwe ha RevolutionNow emeela ngagharịiwe ọzọ na Legọs ka gọọmentị tọhapụ onyeisi ha bụ Omoyele Sowore Cheta na anwụchiri Sowore n'izuụka ole na ole gara aga maka na ọ chọrọ ịhazi ngagharịiwe N'ofesi Ụgbọelu agha mba Syria atụọla ogbunigwe n'ụgbọla agha ndị si mba Tọọkị aga obodo dị n'aka ndị ekweghịekwe Syria. Ndị Tọọkị na-ekwu na mmadu atọ nwụrụ mgbe ogbunigwe ahụ gbara. Anyị ga-eme BBNaịjia nke anyị - Gọọmentị etiti Gọọmentị Naijirịa ga-amalite ime emume nkiri nke ha dịkwa ka Big Brother Onye kwuru nke a bụ onyeisi ngalaba National Council of Arts and Culture bụ otunba Segun Runsewe. Ọ sị na akwamiko a na-ame na emume Big Brother amasịghị omenala Naịjirịa nke mere ha ji ahazi nke ha ga-akwalite omenala. https://www.bbc.com/igbo/afirika-49398182 +politics Eletronic Voting : Ọgbaghara adaala n'Ulọomeiwu Ukwu maka okwu 'electronic voting "Esemokwu dapụtara n'Ụlọomeiwu Ukwu ụbọchị Tozde dịka ndị omeiwu na-adọrịta ụka maka ozi mpụtara si n'aka kọmiti ha hibere maka ịgbanwe Iwu Ntulika nke afọ 20210 nke Bekee kpọrọ Electoral Act No.6, 2010. Mgbanwe iwu ahụ ga-emetụta ntuliaka nke Ọchịchị Etiti, steeti na okpuruọchịchị nakwa Isiobodo Naijiria bụ Abuja. Ụfọdụ ndị senetọ(mmadụ 52) jụrụ Mpaghara iwu ahụ nke kwuru ka e jiri igwe okwu na-ezipu mpụtara ntuliaka. mana mmadụ 28 kwetara na ya, ebe mmadụ 28 abaghị. Ụfọdụ ndị ụlọomeiwu kwetaburu ka e nye ngalaba na-ahazi mgbasaozi n'ekwenti bụ 'Nigerian Communications Commission'( NCC) ikike ịmalite were ekwentị ezipụ mpụtara ntuliaka. Mana ụfọdụ jụrụ ajụ nke butere mba iwe. Ọ bụ ka onyeisi Komịtị Seneti na-ahụ maka Inec bụ Seneto Kabiru Gaya(APC, Kano South) gụpụtachara mpụtara si kọmiti ya ka Senetọ Sabi Abdullahi(APC, Niger North) ka e dozie akụkụ nke 52(3) nke iwu ahụ. Ihe dịbu na ya bụ mpaghara bụ ""Komishọn nwere ike izipụ mpụtara ntuliaka sitere n'igwe eletọnic(ekwentị) oge na mgbe o nwerere ike."" Mana n'akwụkwọ nke Kọmitị ahụ gbanwere, ọ sịrị,""Komishọn nwere ike ilebanye anya na iji igwe eletrọnik zipụ mpụtara ntuliaka maọbụrụ na ngalaba na-ahazi mgbasaozi na'ekwentị ekweta na ọ bụ ozuru-Naijiria-ọnụ nakwa Ụlọomeiwu binye ya aka."" Mana mgbanwe ahụ adịghị ụfọdụ ndị senetọ mma dịka Senatọ Dickson Seriake (PDP, Bayelsa West). Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu bụ Ahmed chọburu ikpọkọta okwu ọnụ jụ ndị kwere na mgbanwe niile komitị mere na ndị ekweghị, mana Senetọ James Manager jụrụ ajụ, sị ka a kpọpụta n'ahịrị n'ahịrị. N'ụlọ omeiwu Nta, okwu gbasara iji igwe eletrọnic eziga mpụtara ntuliaka butere ọgbaaghara nke fọdụrụ ntakịrị ka ọgụ daa. Oge ya bụ okwu malitere, onyeisi ndị omeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila rituru n'oche ya gaa nọdụ n'oche ndị nkịtị, ebe osote ya bụ Idris Wase gara nọrọ n'oche iji kpebie ya bụ okwu. Mana ụfọdụ ndị omeiwu achọghị ka e nye Inec ikike a, ebe ọtụtụ ndị ọzọ chọrọ. Ọ kpọrọ oku ka ndị na-achọghị ka e nye INEC ikike tie mkpu 'aye', ka ndị chọrọ ka e nye ha ya bụ ikike tie mkpu 'nay'. Ụda olu ndị chọrọ ka e nye Inec ya bụ ikike karịrị nke ndị achọghị, mana Idris Wase gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị achọghị ka e nye Inec ikike meriri. Nke a butere nnukwu ọgbaaghara; ndị omeiwu biliri n'oche ha mkpọtụ na-ada n'elu n'ala. Onweghịzị ihe ọbụla a na-ekwu nwere isi. Ndị omeiwu malitere ịkpọ onyeisi ha bụ Gbajabiamila ka ọ laghachi n'oche ya dịka 'Speaker'. Oge Gbajabiamila laghachiri n'oche, o kpebiri na ha ga-agbasa ọgbakọ nke taa ma yigharịa ya echi bụ Fraịde. O kwuru na ha ga-ezigara onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu ozi ka ọ bịa ọgbakọ ahụ bịa kọdoo ha anya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57855640 +business Workers Salary: Abia, Imo na Enugwu so steeti ebe e ji ndị ọrụ ha ụgwọ "N'ụbọchi olemaole gara aga ka ihe onyonyo nke ndị mmadụ sị na ọ bụ Bishọp ụka katolik bụ John Ebebe Ayah na-agwa gọvanọ Cross River steeti bụ Ben Ayade ka o were onyinye nde naịra iri abụọ na ise ọ chọrọ ịnye ụloụka were kwụọ ndị ọrụ eji ụgwọ ọnwa ha. Nke a mere ka ọtụtụ ndị eji ụgwọ ọnwa maọbụ ndị mara ndị e ji ha ụgwọ ọnwa bido kwusịwa okwu ike. Benson Upah bụ ọnụ na-ekwuru otu Jịkọrọ ndị ọrụị Naijirịa bụ Nigeria Labour Confress (NLC) sị na ihe Bishọp Ebebe gwara Ayade maka onyinye ya juru ha afọ. O kwuru sị, ""Ya bụ okwu sitere n'obi ọcha pụta dị mma"". O kwuru na ọ dịghị mfe ịtụhapụ onyinye dị etu a ma sịkwa na ọ bụ ihe gosiri ezigbo nwafọ Naijirịa. Upah kwuru sị, ""Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ steeti ji ndị ọrụ ha ụgwọ ma kọwaa ihe mere o jiri dị etu a, Kama enweghị nkọwa ọbụla nwereisi kpatara ha jiri jide ego ndị ọrụ"". O kwuru na ọ bụ agwa ngalaba NLC akwadoghị n'ụzọ ọbụla. O kwuru sị, "" Mgbe onye ọrụ rụrụ ọrụ ya, ekwesịrị ịkwụ ya ụgwọ ọrụ ya, ọ dị n'akwụkwọ nsọ"". Upah kọwara sị, ""Onye ọbụla bụ onye ọrụ nwere opekatampe mmadụ anọ na-elekwasị ya anya, ma ịkwụghị onye dị etu a ụgwọ ị na-emegide iwu ma na-emekpa kwa ndị ahụ ahụ"". O kwukwara na onye na-eji ndị ọrụ ya ụgwọ na-akwado ụbịam ma na-akwalite mpụ n'obodo. O kwuo sị,"" Enweghị onye họpụtara mmadụ na ntuliaka ka ọ taa ya ahụhụ"". Upah kwuru na ha ndị Gọvanọ ndị a ji ụgwọ enweela mkparịtaụka kwamgbe kwamgbe ma ụfọdụ mgbe ha na ndị otu ha nọ na steeti ndị a emekwaala ngagharịiwe. Ndị nkuzi ụlọakwụkwọ Abia State Polytechnic nke dị n'Aba, Abia Steeti ejirila anya ha hụ ntị ha dịka gọọmentị akwubeghị ha ụgwọ ọnwa kamgbe ọnwa iti atọ. N'ọnwa Juun ka Gọọmentị Abia steeti pụtara sị na ha ewepụtala nde N450m a ga-eji kwụọ ha ụgwọ ọnwa atọ eji ha, kama gọọmentịkwuru na ọ bụ onye ọnataego ụlọakwụkwọ ahụ ji ha ikwunye ya bụ ụgwọ n'ihi na ha enweghị ọbaego nke 'TSA"" a ga-akwunye ya bụ ụgwọ. E nyere onye ọnataego ụlọ akwụkwọ a otu abalị ka ọ mepee ya bụ ọbaego. Onye ntakụkọ BBC nọ na steeti ahụ kwuru na ọnataego emepela ya bụ ọgaego ma ruo tata akụkọ na-apụta, enwebeghị onye ụlọọrụ ụloakwụkwọ a nweterela ụgwọ ọnwa ya. Onye ntakụkọ a gụpụtara ụfodụ ngalaba ọrụ Abia Steeti eji ha ụgwọ ọnwa nke gụnyere Abia State Polythechnic, Abia State University, ngalaba Hospital Management Board, Abia State College of Education, dgz. Ọ kọwara na ndị larala ezumike nka na steeti ahụ sokwa na ndị eji ụgwọ ọnwa olemaole. BBC Igbo kpọtụrụ kọmịshọna mgbasa ozi Abia Steeti bụ Eze Chikamnaayọ kama ọzaghị ekwe ntị ya. N'Enugwu steeti , ndị kachasị ebe akwa arịrị maka ụgwọ eji ha bụ ndị laarala ezumike nka. Otu onye rụụrụ steeti a ọrụ ma laa ezumike nka siri na ọgafeela otu afọ akwụsorola ha ụgwọ ezumike nka ha. O kwuru sị, "" Ọ bụ n'ọnwa Julai afọ 2022 ka ha kwụrụ anyị ụgwọ nke ọnwa Jenuwarị afọ 2021"" Cheta na ndị nkuzi Prịmarị na steeti a gbara abụbọ ọrụ n'ihi na gọọmentị ekweghị ịkwụ ha ụgwọ opekete mpe ekwesịrị ịkwụ ha agbanyeghi na ndị ọrụ gọọmentị ndị ọzọ na-anata ya bụ ụgwọ. Ọ bụ n'ọnwa Mei, ụbọchị isii ya ka ha bidoro ya bụ abụbọ ọrụ ma kwụsị ya n'ụbọchị isii nke ọnwa Jun. Kama kepu kepu na-ekwu na ha ebidola abụbọ ọrụ ọzo agbanyeghị na ụmụ akwụkwọ nọ ezumike ugbua. BBC Kpọtụrụ onye ndụmọdụ gọvanọ steeti a maka mgbasa ozi bụ Steve Orurua, kama o kwuru na onweghị ike ikwu okwu ugbua. Gọvanọ Rivas Steeti bụ Ben Ayade bụ onye Bishop anabataghị onyinye ya ka ndị ngalaba dịka nke Trade Union Congress nke steeti ahụ na-ekwu na eji ndị ọrụ ha ụgwọ. BBC kpọtụrụ Christian Ita bụ onye ode akwụkwọ pụrụiche maka mgbasa ozi nke steeti a n'ekwe ntị kama ọzaghị. N'aka nke ọzọ ka Gọvanọ Benue steeti na-ekwu na ọ na-esiri steeti ya ike ịkwụ ndị ọrụ gọọmentị ụgwọ. O kwuru mgbe ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịta ụka na Benue Steeti n'ụbọchị 22 nke ọnwa Juun 2022 ma sị na ọ bụ dịka ọnụ ego eji arụ ọrụ gọọmentị, NNPC anaghị akwu ego nkwado ha kwesịri ịkwụ ma etu steeti ahụ anaghịzi enwe ike ịkpata ego nke ya." https://www.bbc.com/igbo/articles/cjkevk0jev1o +politics Bola Tinubu: Agụ ‘Bourdillon’ adọriela Osinbajo, Amaechi, Rochas Okorocha na ndị ọzọ "Bola Ahmed Tinubu emeriela ntuliaka imeụlọ ndị otu patị All Progressive Congress bụ APC n’aha ịchafụ. O ji vootu 1271 were merie na ya bụ ntuliaka. Onye na-esota ya n’azụ bụ Rotimi Amechi nwetara vootu 301. Dịka o siri dị ugbua, ọ bụ Bola Ahmed Tinubu ga-anọchite otu APC na ntuliaka onyeisiala Naijirịa nke a ga-eme n’afọ 2023. Ọ bụ ya na ndị gụnyere osote onyeisiala Naijirịa bụ Yemi Osinbajo, onye bụbu Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha, Tunde Bakare, Rotimi Amechi na ndị ọzọ. Dịka ngụkọ ka na-aga n’ihu, onyeisi otu pati All Progressives Congress (APC) na Naịjirịa bụ Bola Tinubu ka enwete mkpọpụta aha na ndị tụnyere ya vootu. Vootu Bola Tinubu na-arị elu ugbua ebe aha ndị ọzọ na-eso ya bụ aka chibụrụ Rivas steeti Rotimi Amaechi, na osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo. A na-agụ vootu ndị delegate mmadụ tụrụ 2260 dịka anya ọha na-ele ntuliaka APC bụ pati nọ n’ọchịchị Naịjrịa kemgbe 2015. A malitere ngụkọ vootu a n’ebe elekere itoolu nke ụtụtụ Weneze, ụbọchị asatọ nke ọnwa Juun, 2022. Ndị 'delegate' si Kaduna steeti bụ ndị ikpeazụ tụrụ vootu nke butere atụmvootu a na-eme na ntuliaka imeụlọ ndị pati APC n'isi njedebe Lee ọnụ ọgụgụ so ngụkọ vootu ndị pụtara ịzọ ọkwa ugbua N'ebe elekere iri. e mechara buru akpati e ji tụọ vootu gawa ebe a ga-anọ gụkọọ vootu. Etu ndị 'delegate' si tụọ vootu gụnyere: Elekere ise nke isi ụtụtụ Wenezde na-akụ dịka ntuliaka ime ụlọ otu pati APC ka na-aga n’ihu. Ndị nnọchịteanya ‘delegates’ si Niger steeti, Borno steeti, Cross Riva steeti na Ondo steeti na-ebinye aka ugbua dịka ha na-atụ vootu ha. Ndị mmadụ ka gbakọ n’ama egwuregwu nke Eagles square dịka a na-eche ka steeti niile tụchaa vootu ha tupu ngụkọ amalite. Akụkọ ka na-abịa. Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buharị ekwuola na otu pati APC agaghị ekwe ka otu PDP dọhachi Naijirịa azụ. O kwuru na a ga-enwe onye mmeri ma nwee ndị emeriri emeri kama o si ka mmadụ niile were obinwanne soro ya bụ mpụtara ntuliaka. Muhammadu Badaru bụ gọvanọ Jigawa steeti ewepụla onwe ya dịka ndị so azọ ọkwa onye ga-eji okolọtọ APC zọọ ọkwa onyeisiala Naijirịa n'afọ 2023. O kwuru na ọ bụ iji nye bọla Tinubu ohere ịzọ ya bụ ọkwa. Uju Kennedy ohanenye kwuru na ọ na-arịtụ n'ihi na ọ bụ Bola Tinubu ga-arụ ọrụ dịka onyeisiala nke ọma. Kayode Fayemi wepụkwara onwe ya iji nye Tinubu Ohere imeri ma sị ndị na-akwado ya ka ha tinyere Bola Tinubu. Godswill Akpabio bụ onye mbụ wepụrụ onwe ya maka Bola Tinubu. O kwuru na ọ bu maka ọdịnma pati APC na Naijirịa ka o jiri mee etu a ma sị ndị na-akwado ya ka ha dọnyere Tinubu ukwu. Ndị ọzo bụ Ibikunle Amosun onye bụbu gọvanọ Ogun Steeti, onye bụbu onyeisi ụlọ omeiwu nta bụ Dimeji Bankole na omeiwu Ajayi Boroffice. Ogbonnaya Onu kwuru na enweghị onye ọ ga-eji maka ya rituo. Ma jụọ sị, "" Kedụ ebe ikpe ziri ezi nọ ma ọ bụrụ na ọbụghị onye si ọwụwa anyanwụ ga-enweta ohere iji ọkọlọtọ pati a zọọ ọkwa onyeisiala"" Otu onye sọ azọ iji okolọtọ APC zọo ọkwa onyeisiala Naijirịa bụ Nichola Felix ewepụla onwe ya iji nye Yemi Osibanjo ohere iji ọkolọtọ APC zọọ ọkwa onyeisiala Naijirịa. Dịka a na-eche ka ebido ntuliaka imeụlọ otu patị APC taa bụ ụbọchị Mọnde, ụbọchị asaa nke ọnwa Juun. Lee ka ọnọdụ ebe ahụ dị ugbua dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari, osote ya b Yemi Osibanjo, Rotimi Amechi, Bola Tinubu na ndị ọzọ wuchirila n'ogige a. Taa ka a ga-ama dike ga-efe ọkọlọtọ pati All Progressive Congress (APC) iji zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 Nke a na-abịa dịka ndị pati a gbakọtarala n'Eagle Square dị n'Abuja ime ntuliaka ime ụlọ a ga-eji họpụta onye ahụ. Dịka o siri dị, ọ bụ mmadụ iri abụọ na atọ ga-aba n'ọgbọ ịmata onye ga-enwete ọkolọtọ ahụ. N'ụbọchị ole na ole ka ọtụtụ ndị Gọvanọ APC si mpaghara Ugwu nwere nkwekọrịta ka a họpụta onye si mpaghara Ndịda. Ebe kepukepu ọzọ kwuru na onyeisioche APC bụ Abdullahi Adamu họpụtara Ahmed Lawan bụ onyeisi ndịomeiwu dịka onye a kpọrọ 'consensus candidate' Mana Onyeisiala Muhammadu Buhari na nzukọ ya na ndị Gọvanọ nwere sị na ""O nweghi onye ọbụla m tere mmanụ n'isi"". Ọ sị ka e nye onye ọbụla na-azọ ọkwa ohere ka ndị pati ha nwee ike họpụta onye ha chọrọ. Dịka ọ dị ugbua mmadụ iri abụọ na atọ ndị na-azọ ọkwa a ga-aba n'ihu ọrụ maka ntuliaka a. Ahmad Lawan Bola Tinubu Chibuike Rotimi Amaechi bụbu minista njem Naịjirịa ma bụrukwa aka chịbụrụ Rịvas steeti. Yemi Osinbajo Tunde Bakare Anayo Rochas Okorocha David Nweze Umahi Kayode Fayemi" https://www.bbc.com/igbo/articles/c4npnr0zye1o +entertainment Judy Austin: Nwunye Yul-Edochie nke abụọ gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara mgbe ọ mụrụ nwa "Judy Austin na-eme ejije Nollywood gwara BBC Igbo etu o si nabatakwa ahụ ya mgbe ọ mụchara nwa ya n'afọ 2021. Austin bidoro wuwekwa ọzọ dịka Yul Edochie bụ onye na-eme ejije na Nollywood depụtara n'akara facebook ya na Judy Austin mụụrụ ya nwa nwoke bụzi nwunye nke abụọ ya. Na mkparịtaụka ya na Uche Ogbodo na BBC Igbo nwere n'ọnwa Novemba 2021, Judy kwuru na mgbe ọ dị ime, na nri anaghị ekwe ya eri nke mere ka ọ tara ezigbo ahụ. O kwuru na mgbe ọ mụchara nwa, o ruru ọnwa abụọ tupu o riwekwa nri. Ọ katọrọ etu ndị mmadụ si agwa ụmụnwaanyị na ha ebukazi ma ha mụchaa nwa. Austin jikwa ohere ahụ dụọ ụmụnwoke ọdụ ka ha nyere nwunye ha maọbụ onye ha na ha mụkọrọ nwa aka ileta nwa ọhụrụ ahụ. N'ọnụ ya, ""ụmụnwoke kwesiri ị na-enye ụmụnwaanyị ha mụrụ ha nwa ezigbo ego makana ịlekọta nwa ọhụrụ adịghị mfe."", ọ rịọ gị ihe dịka obere ego, inye ya nke karịrị ego ahụ ọrịọrọ gị."" Austin kwuru na ọ dị mkpa ka nwaanyị nye nwa ara ọfụma, makana o ga-enyere nwa ahụ aka. O gwara onye ntaakụkọ anyị na ihe ọ sọrọ ndị mmadụ katọọ ahụ ya, ""onweghị ihe ọbụla ndị mmadụ kwuru na-echu ya ụra ya."" Austin kwuru na ọ bụ onye Umuoji dị n'Anambra steeti. Uche Ogbodo bụkwa onye na-eme ejije na Nollywood mechara bata na mkparịtaụka ahụ ma kwụkwa ihe ndị ọ na-agabiga dịka ọ mụchara nwa ikpeazụ ya. Ogbodo kwuru na ọ na-agbagoju anya ihe mere ndị mmadụ ji hapụ ndụ nke ha na-achọ imata maka ndụ onye ọzọ. Gere ihe ha kwuru n'uju n'ihe nkiri a dị n'akụkọ a. Ezigbo aha ya bụ Muoghalu Uchechukwu Judith. Ọ bụ onye ejije Nollywood, nke ya na Yul Edochie mekọrọla ejije mbụ. Ọ bụkwa onye mmepụta ejije nke Bekee kpọrọ producer; o mepụtala ejije a kpọrọ ""Native Girl"" nakwa ""Fear"". Ọ malitere ime ejije n'afọ 2013. Ọ bụ onye Anambara steeti. A mụrụ ya n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba. Ọ gara mahadum na Nnamdi Azikwe University, Awka. Na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Vanguard nwere n'afọ 2020, Judy kwuru sị na ọ naghị ""ahụ alụmdinanwunye dịka ihe mmadụ ji etozu oke"". Yul Edochie bụ onye na-eme ejije Nollywood. Ọ bụ nwa Peter Edochie na-emekwa ejije Nollywood. Ọ bụ onye Nteje dỊ n'Anambra steeti. Yul na nwunye ya bụ May Edochie ji ụmụ anọ gụnyere otu nwaanyị na ụmụnwoke atọ. O kwuru na ọ lụrụ May mgbe ọ dị naanị afọ 22, n'ụbọchị 31 nke ọnwa Ọktoba afọ 2004. A mụrụ ya n'ụbọchị asaa nke ọnwa Jenụwarị afọ 1982. N'afọ 2017 ka Yul Edochie zọrọ ọkwa gọvanọ nke Anambra steeti n'okpuru pati Democratic Peoples Congress (DPC)." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61265069 +health Coronavirus Symptoms: Ọ bụrụ na ị naghị anụ ụtọ nri maọbụ isi, i nwereike ibu coronavirus "Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ha anaghị anụ isi maọbụ ụtọ nri na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ugbua nke mere ka ụfọdụ na-ekwu na ọrịa coronavirus abala obodo n'ike. Anaghị anụ isi maọbụ ụtọ ihe bụ otu njirimara ọrịa coronavirus nke na-egosi na-ahụ ndị ụfọdụ ọrịa ahụ ji. Site Ọnịcha gawa Abakaliki, ndị mmadụ na-ekwu na ha rịara ọrịa nke gụnyere anaghị anụ ụtọ na isi ihe ọbụla. Uche Nwonwu bụ onye Enugwu gwara BBC Igbo na kemgbe abalị ise ya anụbeghị ụtọ ihe maọbụ isi ihe. Ọ sị: ""Ihe a malitere ubọchị ụka. Dịka ọ na-eme m, ewetere m akpụ nso n'ime m mana anụghị m isi ya."" Nwonwu gakwara n'ihu kwuo na ọ bughị sọsọ ihe a na-eme ya. ""Isi na-awa m, ahu ọkụ na-emekwa m. Azụzụ na-asụchị m imi n'abalị ebe ike na-agwụkarị m."" Nwaada Nwonwu no n'ime obodo, nke pụtara na ebe gọọmentị hibere ka a na-eme nyocha ma mmadu ebu coronavirus adịghi ya nso. Ọ gwakwara BBC na ọbụghị sọsọ ya ka ụdịrị ihe a na-eme n'obodo o bi. ""Otu enyi m gwara m na ihe dị otu a mere ya. Ụfọdụ ndị nọ ebe m gara igo ọgwụ sịkwa na o mere ha."" Chidiebere Ike bụ onye na-ere ọgwụ n'Aba gwara BBC na ya bụ ihe a na-akọ akụkọ ya doro ya anya ọfụma dịka ya rịara ya ma zute ya dịka ọ na-atụ mgbere ya. Maazị Ike sị: ""Anyị erebeghi ọgwụ ịba ruo etu anyị siri ree ya site n'ọnwa Mee ruo Juun."" ""Nke a bụ maka na ọtụtụ mmadụ na-ewete ama ọrịa ịba n'ahụ ha. ""Ama ndị a gụnyere isi ọwụwa na ahụ ọkụ. N'otu aka ahụ, ọtụtụ mmadụ na-ekwukwa na ha anaghị anụ isi maọbụ ụtọ nri."" Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya hụrụ ụdịrị ama n'ahụ ya nakwa nke ezinaụlọ ya. ""O mere m ruo abalị iri ise ma mekwa ndị be m. Emekwara m nnyocha iji mata ihe ọ bụ mana a hụghị nke 'malaria' maọbụ 'typhoid' n'ahụ m."" Na soshal midia ọtụtụ mmadụ kwenyekwere na ha hụrụ ụdịrị ihe maọbụ na omere ha. Dọkịnta Nneoma Sibigam gwara BBC na ihe a ndị mmadụ na-ekwu na-eme ha dịka ka ama coronavirus. ""Ihe ọhụru a gwara anyị banyere coronavirus bụ na ọ na-eme ka ndị mmadụ ghara ịnụ isi na ụtọ ihe. Nke mere na o nwereike bụrụ nje ka ndị bu."" Dọkịnta Sigibam sị ka ndị nwere ụdịrị ama gaa ebe gọọmentị hibere maka nyocha coronavirus. Ọ sịkwa na ihe a agaghị abụ ịba maọbụ azụzụ makana ịba na azụzụ anaghị eme ka mmadụ gharị ịnụ isi na ụtọ ihe kpam kpam. Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigerian Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na anaghị anụ ụtọ maọbụ isi bụ otu njirimara coronavirus. Ha sị onye ọbụla hụru onwe ya n'ọnọdụ a kwesịrị ịkpọ ekwentị ndị na-ebuso coronavirus agha na steeti ebe ha nọ. Ngalaba NCDC wepụtekwara akara ndị ekwesiri ịkpọ banyere ihe a na steeti dị iche iche. Leekwa ebe akara ekwentị ndị a dị. Ka ọ kwụ ugbua, ihe karịrị mmadụ puku iri abuọ na asaa ebutela coronavirus na Naịjirịa ebe mmadụ 616 anwụọla. Agbanyeghị na ụfọdụ mba dị ka Chaịna na ụfọdụ mpaghara Yurop ahụra mbelata ọrịa a, Naịjirịa ka so na mba ndị ọ ka na-abanwanye." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53281045 +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: FIFA ga-enyocha Vida maka okwu megidere Rọshịa Akụkọ ndị dị mkpa Onyeisi ndị ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki ga-akpọrọ ndị otu ya ndị ọzọ gaa njem nleta n'ụlọ ndị omeiwu mba Amerịka taa. Ihe ndị ha ga-arụtụ aka na njem a gụnyere nwulite mmekọrịta ndị omeiwu na usoro ọchịchị mba Naịjirịa na mba Amerịka. Ebe ọzọ na Naịjirịa Ndị gọvanọ na-achị mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ekwuola n'onweghị oke ala ha nwere maka ọrụ ngo ma ọfụdụzie ogbe ebe a na-azụ ehi Okwu nke a bụ ihe pụtara na-akwụkwọ ozi onyeisi ha bụ Dave Umahi wepụtara n'ime mkparịta ụka ha mere ụnyaahụ. Na mba ofesi, E chere na mmadụ ruru otu narị anwụọla ebe iri na ise na-efu efu na mpaghara ọwụwa-anyanwụ mba Jaapan n'ihi oke mmiri ozuzo nke butere oke idemmiri. Mmiri ozuzo a malitere kamgbe abalị ise gara aga ji ugboro atọ karịa etu mmiri si ezo n'ebe ahụ n'ime ọnwa Julaị. N'Egwuregwu FIFA ebidola ime onye ọgba bọọlụ mba Kroeshia akpọrọ Vida nyocha maka okwu megidere mba Rọshịa o kwuru n'ihe onyonyo. N'otu aka ahụ ngalaba na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na Brazil adọọla ndị Brazil aka na ntị maka ị kpa oke agbụrụ megide onye otu egwurewgwu ha bụ Fernadinho maka ọkpụ o nyere megide ha n'asompị iko mba ụwa. Gee akụkọ ndị mere taa n'ịchafụ Ihe onyonyo nke taa https://www.bbc.com/igbo/afirika-44763691 +politics Nonye Soludo's wife: Ọmalịcha nwaanyị na-ebu Chukwuma Soludo, gọvanọ ọhụrụ Anambra isi "Ọchịchị efela aka Charles Chukwuma Soludo dịka gọvanọ Anambra steeti dịka o meriri ntuliaka e mere n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba 2021. Mana dịka ndị Bekee na-ekwu na nwoke ọbụla na-eme ọfụma nwere ọmalicha nwaanyị na-akwado ya. Mmeri Chukwuma ji ọkọlọtọ pati All Progressives Grand Alliance (APGA) na ntuliaka ahụ, pụtara na nwunye ya bụ Nonye ga-ewere ọnọdụ dịka nwaanyị mbụ nke steeti ahụ, nke Bekee kpọrọ ""first lady"". Ụfọdụ ọrụ eji mara ndị nwunye aka na-achi obodo gụnyere: N'agbanyeghị na akwụkwọ iwu Naịjirịa akwadoghị ụlọọrụ nwunye onyeisiala maọbụ nwunye Gọvanọ steeti ọbụla na Naịjirịa, ọ bụ nnukwu ọkwa nye ndị nwunye onye ọbụla na-achị tụmadị n'Anambra steeti. Andy Ubah, Valentine Ozigbo na Ifeanyi Ubah so na ndị ọzọ zọrọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti a kacha kpụrụ n'ọnụ mgbe ahụ. Lee ihe ị kwesịrị ịma maka ndị nwunye ha: Uchenna bụ nwụnye Ifeanyi Ubah, onye na-azọ ọkwa gọvano n'okpuru Young Progressive Party (YPP). Uchenna dị afo 48 ugbua dịka a mụrụ ya na Mee 13, 1973. Ya na di ya ebiela dị ka di na nwunye ruo afọ 24. Uchenna na-arụ n'ụlọọrụ 'Capital Oil and Gas Industries Limited' ebe a na-emepụta mmanụ agbidi, ọ gụrụ 'Business Administration' na mahadaum Ahmadu Bello nke dị na Zaria. Ya na di ya ji ụmụ ise. Mary-CallistaOjiugo Ozigbo Ojiugo bụ nwunye Valentine Ozigbo bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati People's Democratic Party (PDP). Ojiugo bụ onye na-enyere ndị mmadụ aka nke ọkankụ ha bụ ụmụakwụkwọ. Ya na di ya na-enyerekwa ndị mmadụ aka site na ngalaba 'Valentine Chineto Ozigbo (VCO) Foundation' nke ha abụọ hibere. Ha ji ụmụ anọ. Andy Uba bụ onye ji ọkọlọtọ All Progressives Congress (APC) zọọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti n'afọ 2021. Ruo ugbua ọtụtụ mmadụ amagh�� kpọkwem onye bụ nwunye Uba maka na anaghị ahụkarị ebe ha abụọ kwụ n'ọha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59196113 +health Ọkọ ngada: Gịnị na-ebute 'Ọkọ Junction'? "Ọtụtụ mmadụ na-akọ ọkọ na ngada mana ha amaghị ihe na-akpata ya. O nwere ọtụtụ aha e ji mara ọkọ a nke gụnyere 'ọkọ Junction', 'Ọkọ tee', ' ọkọ achọrọ m ịma', dgz. Ọrịa ọkọ ngada nke a na-akpọ Jock Itch n'okwu bekee bụ ọrịa ọkọ na-ebute ahụ mgbakasị. Ọkọ a nwereike ọ bịa mgbe ha chọrọ ime ihe dị mkpa maọbụ mgbe ha nọ n'etiti ndi mmadụ. Akụkọ a ga-gwa gị ihe na-akpata ọkọ ngada, mgbochi ya na ọgwụgwọ ya. BBC Igbo kpọtụrụ ọkammụta Uche Ojimma bụ ọkachamara maka ihe gbasara anụahụ mmadụ ma bụrụkwa onye isi Dermatologist Department nke University Of Nigeria Teaching Hospital. O tinyere ọnụ n'okwu a ma kụwa akụoyibo nsugbe gbasara ya bụ ọrịa ngada. Gịnị bụ ọrịa ọkọ ngada maọbụ Jock Itch? Dọkịnta Uche Ojimma kọwara na ọ bụ nje a na-akpọ dermatophytes na-ebute ya. Dermatophytes a sị n'ezinụlọ nje Bekee kpọrọ 'Fungus'. Ojimma kọwara na aha bekee ya bụ Jock Itch sitere ma bido dịka ndị na-eji ịnyịnya eme asọmpị a na-akpọ Jockeys na-ebute karị ya site n'ahụ ịnyịnya. Ya bụ ọkọ na-emekarị na ngada nwoke ma na-eme kwa ụfọdụ ụmunwaanyị. Ọ kọwara na ihe na-amasị nje Dermatophytes n'ahụ mmadụ bụ ceratin nke na-adị n'anụ ahụ, mbọ aka na ntụntụ isi. Ọ bụ ceratin a ka nje a na-eri. E nwere ọtụtụ ụzọ mmadụ si ebute ya bụ ọkọ ngada, kama otu ihe mmadụ kwesiri ịma bụ na ọdịda Afrịka ebe a na adịkarị ọkụ ma ikuku na-adị kwa mmiri mmiri nke a kpọrọ Humid na Bekee socha n'ihe na enyere aka ebute ọkọ ngada. Ọ bụ Dkt Ojimma kwuru nke a ma kọwa kwaa na ebe dị etu a na-eme ka ngada mmadụ nwee ọsụsụ ma di ọkụ. Ọ kọwara na ọ bụ ebe dị etu na-amasị nje Fungus nke na-ebute ọkọ ngada. Ọkọ ngada na-eme ka ahụ mmadụ na ekpecha ekpecha, ọ ga-akpọ nkụ ma na-acha kwa uhie uhie n'etiti ngada. Ojimma kwukwara na ọkọ a nwereike site na mbọ mmadụ ma fee na ebe ndị ọzo n'ahụ mmadụ. Ọ na-ebute oke ịkọ ọkọ na ngada, o nwereike site na ngada gafee n'ike mmadụ. 1) Ụgbọrọ ole ka ị na-eyi obante gị tupu ị saa ya? E nwere ndị na-asa obanta ha nanị mgbe o si were nsị. Dọkịnta Ojimma kwuru na ọ bụ nanị otu ugboro ka mmadụ kwesiri iyi obante ya Ọ kọwara na ọ dị mkpa mmadụ iyi obante nanị otu mgbe ma saa ya mmiri. Nke a agaghị enye nje dermatophytes ịmubanya n'ahụ mmadụ. 2) Lee kwa ma ọ bụ cotton ka eji mee obante gi Dtk Ojimma si "" Anytị na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha na-eyi uwe okpuru maọbụ boxer eji cotton mee"". O kwuru na nke a ka mma karịa mmadụ iyi 'Tight' nke na eme ka ọsụsụ na asụ mmadụ na ngada. Ojimma kwuru na obante eji cotton mee ka mma n'ihi na cotton ga amipụcha ọsụsụ ma nye kwa ohere ka ikuku na abata na ngada. 3) . . . Umunwaanyị kwanu? Dkt Ojimma kwuru sị ""Ọ dị mkpa ka ụmụnwaanyị na-eyi ịba nwere ohere ikuku sị apụ ma nke e ji cotton mee"". O kwukwara ka ụmunwaanyị na eyi obante ha nanị otu ugboro. Ojimma rụtụkwara aka na ọ dị mkpa ka ha na-asa ahụ ha oge niile. 4) Ozughị nanị n'ịsa obante gị Dkt Uche Ojimma kwuru sị "" Onye sachaa obante ya, ya were igwe iron dakpọọ ya"". Ọ kọwara na nke a ga-eme ka ọkụ si n'igwe Iron gbuo nje ọ bụla nwereike ị nọ n'ọbante. 5) ị na-eyi uwe ukwu maọbụ trauza mmadụ? Biko eyizila uwe ukwu mmadụ ọzọ maọbụ trauza ya. Ojimma kọwara na akpụkpa ahụ onye ahụ nwereike i site na trauza onye ahụ banye na nke onye ọzọ. Ọ kọwara na nke a bụ otu uzọ ọkọ ngada sị efesa. 6) ""Biko, nye m tọwel gị ka m were hichaa ahụ"" Biko sị mba! Dkt Ojimma kwuru na mmadụ iji akwa eji ehicha ahụ nke mmadụ ọzọ bụ etu ọzọ esi ebute ọrịa ọko ngada. O kwuru ka ọ bụrụ nanị otu onye ga-enwe akwa eji ehicha ahụ ma na sa kwa ya oge o kwesiri. 7) Ị dịna n'otu akwa Ụfọdụ mgbe, onye nwere ọrịa ọko ngada kọchaa ọko, akpụkpa anụ ahụ ya nke bekee kpọrọ ""scales"" nwereike dasa n'elu akwa. Mgbe onye ọzo dịnara na ya bu akwa, akpụkpa anụ ahu a banye ya na ngada, onye ahụ nwereike ibute ọrịa ọko ngada. 8) Aramara! Eeeeee! Dkt Ojimma kwuru sị ""Onye nwere ọkọ ngada nwereike ibunye onye ọzọ ya bụ ọrịa ma ha abụo nwee mmekọ. Ọkọ 'junction' na-ara ahụ ịgwọ. E nwereike iji ntule chọpụta ya kama ọ dị mkpa ka mmadụ gaa ụlo ọgwụ maka nyocha. Dkt Ojimma kwuru na ọgwụgwọ ọrịa ọkọ ngada na-esi ike ma na-akarị kwa otu ọnwa. E nwere ọtụtụ ọgwụ eji agwọ ya nke a na-akpo anti-fungal. E nwere nke a na aṅụ aṅụ ma nke a na-ete n'ahụ. Ndụmọdụ Dkt Ojimma gwara ndị mmadụ bu sị "" idị ọcha dị oke mkpa, biko yie ịba gị nanị otu mgbe"". Gbam!" https://www.bbc.com/igbo/53787536 +business Ị ma na a na-ere nsi akpị n'ahịa ugbua? Ndị ọkammụta sayensi na-amịpụta nsi akpị n'ụlọọrụ nnyocha ha dị na Tọkị. Ha na-ere ya nde dọla ole ma ole na Yurop. Ha sị na e ji ya emepụta ọgwụ na-akwụsị ahụ mgbu nakwa ọgwụ ndị ọzọ. Ha sị na ọ na-ara ahụ maka na otu akpị nwere nsi dịka miligram abụọ. I chere na ị ga-emenwu ụdị azụmahịa a? https://www.bbc.com/igbo/articles/cqlk8vpz482o +sports Transfer Deadline: Lee ndị a zụrụ na ego ole a zụrụ ha na EPL "N'elekere isii (elekere ise na England) nke mgbede taa bụ Tọọzde abalị asatọ nke ọnwa Ọgọst ka 'ọba ahịa' ndị otu egwuregwu bọọlụ nke England ga-apịachi. Ọba ahịa abụghị ahịa a na-ahụ anya kama ọ bụ oge e wepụtara ka ndị otu egwuregwu bọọlụ dị iche iche zụrụ ndị ga-agbara ha bọọlụ maọbụ ree ndị ha achọghịzi. BBC Igbo na-ewetara gị otu ihe si gbata kwụrụ ugbua n' egwuregwu, ""English Premier League"". Alex Iwobi Nwaafọ Igbo a ga-ahapụ Arsenal gawa Everton dịka otu abụọ a kwekọritara ego dị nde paund iri anọ (£40 million). Everton bu ụzọ kweta ịkwụ nde paund iri atọ (£30 million) maka Iwobi, mana Arsenal jụrụ ajụ. Mana ha mechara kwelite ọnụ were zụrụ ya. N'aka nke ọzọ, ndị Arsenal zụtara otu nwata nwokorobịa aha ya bụ Kieran Tierney. Tierney onye mba Scotland gbabuuru ndị Celtic. Ọ gbara afọ iri abụọ na abụọ. Romelu Lukaku Nwaokorobịa a na-agbaburu otu egwu Manchester United ahapụla England gawa mba Italy ebe ọ ga-esonyere ndị otu egwu Inter Milan. Man Utd na Inter ekwekọrịtala ego dị nde paund iri asaa na anọ mana a na-ele anya na ego ahụ ga eru nde paund iri asatọ n'ọdịnihu. Lukaku erutelarị na Italy ebe a ga-enyocha ya ahụ tupu o binye aka n'akwụkwọ. Ọṅụ juputara ndị nkwado Inter Milan obi n'ihi ọbịbịa Lukaku. David Luiz na Laurient Koscielny Luiz ahapụla Chelsea, mana ọ gateghị aka n'ihi na Arsenal ebe ọ gara ka dịkwa na London bụ ebe Chelsea dị. Arsenal zụrụ Luiz iji nọchie anya Laurient Koscielny bụ onye gbara abụbụ hapụ ha gawa obodo ya bụ France wee sonyere ndị Bordeaux. Bordeaux kwụrụ Arsenal nde Euro ise iji zụrụ Koscielny, ebe Arsenal kwụrụ Chelsea nde paund asatọ maka Luiz. Paulo Dybala na Mario Mandzukic Akụkọ kọburu na ndị Manchester United nwere ike ịzụta Paulo Dybala maọbụ Mario Mandzukic iji nọchie anya Lukaku. Dybala na Mandzukic na-agbara otu egwu Juventus, mana ọdịghị ka okwu ha na Man Utd a ga-enwe isi. Ndị otu Tottenham tinyekwara anya maka Dybala mana nke ahụ amịtaghị mkpụrụ ọbụla. Wilfried Zaha Nwaokorobia Ivory Coast a etinyela akwụkwọ na-agwa ndị Crystal Palace na ya chọrọ isi n'otu ha pụọ. Agwa a Zaha kpara gbawara ndị Palace obi n'ihi na ọ bụ otu onye ha ji eme ọnụ. Arsenal na Everton egosila mmasị ịzụrụ Zaha mana amabeghi ka ọ ga-esi dị. Crystal Palace kwuru na ha agaghị ere Zaha ma ọ bụrụ na ha azụtaghị onye ga-anọchị ya. Marcos Rojo Rojo esozighị n'ihe a na-eme na Manchester United, mana Everton chọrọ ya. Mkparịtaụka ka na-aga n'ihu n'etiti otu egwuregwu abụọ a maka Rojo, mana oge adịghịzii. Akụkọ na-abịa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49281299 +sports Fifa World Cup Qatar 2022: Ihe ndị a na-atụ anya ya n'asompi 'World Cup' malitere taa "Taa bụ ụka, abalị 20 nke ọnwa Novemba, afọ 2022, ka a na-amalite asọmpi iko mba ụwa (2022 Fifa World Cup ) na mba Qatar. Asọmpi 2022 Fifa World Cup bụ asọmpi egwu bọọlụ ụmụnwoke nke mba otu egwu bọọlụ ụmụnwoke ha nọ n'otu Fifa. Ya bụ asọmpi a ga-eme otu ọnwa ga-akwụsị n'abalị 18 nke ọnwa Desemba afọ 2022. A ga-eme asọmpi ahụ n'ama egwuregwu asatọ n'obodo ise. Ụnyahụ bụ Satode ka ndị na-akwado egwu bọọlus si mpaghara ụwa dị iche mere emume ha. Asọmpi mbụ ga-abụ n'etiti Qatar na Ecuador n'amaegwuregwu 'Al Bayt Stadium' dị n' Al Khor. Asọmpi nke ikpeazụ ga-abụ n'abalị 18 nke ọnwa Disemba nke ndị ga- asọmpi ndị ga-asọkọ nke ụbọchị ikpeazụ ga-abụ ndị meriri ibe ha rue agba nke ọkara ikpeazụ. A na-atụ anya na otu egwu bọọlụ mba 32 ga-esonye n'asọmpi ahụ nke bụ mbụ a na-ehiwe asọmpi ahụ n'mba Arab. Nhibe e hibere asompi Fifa nke afọ 2022, ebutela ọtụtụ nsogbu na nghọtahie. A na-ebo mba Qatar ebubo mpụ dị iche iche nke mere ụfọdụ mba ji ekwu na ha agaghị abịa ya bụ asọmpi. N'ọnwa Febụwarị afọ 2021, ụlọntaakụkọ Guardian nke London kwuru na ndị ọrụ mbịarambịara si Pakistan,India,Bagladesh na Sri Lanka dị puku isii,narị ise(6500)nwụrụ na Qatar kemgbe hamba ahụ nwetara ikike ị bụ ebe a ga-anọ so mpi iko mbaụwa. Quatar meriri mba Japan, Ọstrelia, Saụt Korea na Amerịka were nweta ikike a. Ebubo ndị a gụnyere imekpa ndị ọrụ mbịarambịara ahụ, imegbu ndị nwoke maọbụ nwaanyị na-edina ibe ha,imegide ikike dịrị onye nakwa ebubo na ha nyere ngarị iji nweta ikike ịbụ ndị a ga-asọ mpi ahụ na be ha. Sep Blatter bụ onye bụ onyeisi Fifa oge Qatar nwetara ikike ịbụ ebe a ga-asọ mpi ahụ afọ iri gara aga ekwuola na ọ bụ ""ndahie""' inye Qatar ikike ahụ. Qatar abụghị mba e ji ịgba bọọlụ mara , mba ahụ bụkwa mba na-enwe oke ekpomokụ ya mere ọtụtụ e jighị ghọta ihe mere Fifa ji nye ha ụdị ohere a, ebe ụfọdụ na-arụ aka ma na-ebo Fifa ebubo nrụrụaka n'etu nhọpụta ahụ siri gaa. Na'izu ole na ole gara aga, e nwere ebubo na mba Qatar kwụrụ ụfọdụ ụmụamala ha ndị egwu bọọlụ na-amasị ego ịbụ ndị enyi ha si mba ndị ọzọ, mana ndị na-ahazi asọmpi ahụ gọrọ na akụkọ abụ aụgha.Gọọmentị Qatar kwuru na ọ bụ ịkpa oke agbụrụ kpalitere nkatọọ. Mana onyeisi otu Fifa ugbua bụ Fifa Gianni Infantino katọrọ mba ndị dị n'Ọdịda Anyanwụ Yurop sị na nkatọ ha na-akatọ Qatar bụ ""meremere n'ihu, gwọmpụta n'azụ."" E tere ogiri, e tere ụgba, agha akara aka, anaghị eri ngwọrọ. Ụbọchị akara aka eruola." https://www.bbc.com/igbo/articles/cx9eykqn5dko +sports Manchester United vs Wolves: Otu abụọ a bụ nnọọ ezigbo di na nwunye Otu egwuregwu bọọlụ Manchester United na Wolves dịzi ka ha abụ di na nwunye n'eziokwu. Ha abụọ eneyghị goolu ọbụla oge ha zutere n'ọgbọ egwuregwu 'Old Trafford' n'uhuruchi Satọdee. Ọ bụrụ na Tottenham emerie Manchester City ụbọchị ụka, ha ga-awufere ma Manchester United ma Wolves. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51343690 +entertainment "Chiwetalu Agu arrest: ""Drama' m mere bụ ka a mara na ndị Igbo nọ ya" "Ome ihe ejije ama ama bụ Chiwetalu Agu ekwuola na ihe mere ya ji mee anwansi mere o ji dabaa n'aka ndị Agha Naijiria bụ ""ka a mara na ndị Igbo nọ ya"". Agu kwuru nke a n'Enugwu n'emume ndị otu ikọrọ ndị ihe ejije, a kpọrọ 'Actors' Guild of Nigeria' ngalaba nke Enugwu kpobaara ụbọchị Tọzde. Agu kwuru sị, "" Anyị bịara ịgwa ndị ọcha na ndị ojii na e nwere ndị a na-akpọ Ndị Igbo,ha bụ ọkụ na-acha- 'Rising Sun'"". "" Anyị ga na-amụke ka ọnwa, ụwa a na-ahụ anyị."" Ọ gara n'ihu kwuo sị, ""'Drama' (anwansi) ahụ m mere dị mkpa, ka ha mara na ndị Igbo nọ ya."" N'okwu o nwere mmerụ ahụ o nwetara n'aka ndị nwụchiri ya, Chiwetalu Agu kwuru na "" ""Site n' Upper Iweka rue 82 Division, rue ogige DSS, o nweghị onye metụrụ m aka."" "" Ndị agha nile welitere isi chọrọ itinye onwe ya n'okwu a ka hana Chiwetalu Agu nwee ike kpakọọ."" N' inye ndụmọdụ etu udo ga-esi lọghachị naza Ọwụwa Anyanwụ, Agu kporo oku sị: ""Onye na-achị ehi abazịla n'ọhịa ndị Igbo maka na ọ bụ ebe ndị mama anyị si eri."" ""Onye ndị ọchịehi kpara n'ubi ya, ya gaa gwa ndị uweojii."" Mana Agu tụrụ arịrị na oge gara aga, na ndị kpesaara ndị uweojii na e mebiri ubi ha, na o nweghị ihe ha mere maka ya. N'ozi ya n'ọgbakọ ahụ, Patience Ozokwor bụ onye ejije Nollywood a ma dịka 'Mama G' kpọrọ ndị Igbo oku ka ha malite igosi onwe ha ịhụnanya. Mama G kwuru na nke a ga-eweta ọganihu mpaghara ahụ. Ọ kpọkwara oku ka ha wetuo obi ma chọọ udo na mpaghara Owụwa Anyanwụ sị, ""Anyị hakwaa be anyị, o ree ure."" Ọ dụrụ ụmụ Igbo, ọkachasị ndị na-eme ihe ejije ọdụ sị, ""Buuru ihe ị chọrọ n'obi, na ụbọchị adịghị mma."" ""Onye ọbụla nọọrọ nwayọọ, n'ihi na chi jiri eji ga-efo efo."" ""Ndị Igbo hugodu onwe anyị tupu anyị kpewe ekpere ka ndị ọzọ hụ anyị n'anya."" ""Anyị na-aṅụ ọbara onwe anyị, Igbo chọọnụ ọdịmma onwe ụnụ."" Ọ gara n'ihu too ndị ndu AGN maka mbọ ha gbara n'ịhụ na a tọhapụrụ Chiwetalu Agu. Ọtụtụ ndị ihe ejije Nollywood akatọọla agwa ndịagha kpasara ogbo ha bụ Chiwetalu Agu bụ onye ha nwụchiri n'ụbọchị Tọzde maka iyi agwa Biafra. N'ozi ha wepụtara n'akara soshal midia, ọtụtụ n'ime ha na-ekwu na ya bụ agwa bụ mkpagbu. Onye bubụ onyeisi otu jikọrọ ndị n'eme ihe ejije a kpọrọ, ""Actors Guild of Nigeria(AGN) bụ Emeka Ike sị na ọ bụ mkpagbu. N'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya, Emeka Ike kpọrọ gọọmentị oku sị, ""Tọhapụnụ ndị niile e ji eji maka nkwenye ha. Mkpagbu adịghị mma."" N'otu aka ahụ , Harry Anyanwu na-emekwa ihe ejije onye kpọrọ mere ""ara"" jụrụ ihe mere e ji nwụchie Chiwetalụ agụ. Anyanwu gara n'ihu sị, ""Olee mgbe ara a ga-ebi?"" Chinyere Winifred bụkwa onye ejijie kwuru na akara Instagram sị, "" Ihe nke adịghị mma."" Charles Okocha sị, ""Ana m akatọ agwa adịghị mma a. Kedụ ihe Chiwetalụagụ mere. Aghọtaghị m ya ma ncha."" Walter Anga tụrụ arịrị na ọ bụ ""nwoke tinyerela ndụ ya niile n'ịkpa ndị mmadụ ọchị ọbụladị mgbe di biụlọ na-achụgharị ihe ezunaụlọ ya ga-eri"" ka e mere ihe. Cheta na ndị agha Naijiria nwụchiri ome ihe ejije Chwetalu Agu n'abalị asatọ nke ọnwa Septemba, afọ a (7/10/2021) maka iyi akwa Biafra. Ndị agha boro ya ebubo na ọ na-enye otu a machiri amachi bụ Ipob nkwado mana mecha tọhapụya ụbọchụ 8/10/2021 nyefe ya n'aka ngalaba uweojii nzuzo bụ DSS. Chiwetalu Agu bụ onye ihe ejije Nollywood a ma ama maka ị na-ekwu okwu ọchị n'ihe onyonyo ọbụla o sonyere na ya. O sonyela n'ọtụtụ Ihe ejije gụnyere: Things Fall Apart, Taboo, Wedding Party 2, The Catechist wdg. O rietala nturuugo dị iche iche gụnyere nzere ọkaibe na ejije ọdinala n'afọ 2012 ('best actor in indigenous movie'). Ma lee ihe ndị ị maghị maka aka ochie ahụ na ewu na soshal midia maka akụkọ na ndị agha nwụchiri ya n'Upper Iweka, Ọnicha, ụbọchị Tọzde maka iyi akwa Biafra: A na-ahụta ya dịka oke mmọnwụ maka afọ ole ọrọnala na Nollywood nakwa ọtụtụ ihe ejije o sonyerela na ya nke mere ka ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụ ya dịka nnukwu mmadụ. Mana Chwetalu Agu anaghị eme ngala inwe ọkwọụgbọala na-akwọ ya. Ọ na-akwọ onwe ya aga ebe ọbụla ọ na-aga. A na-anụ aha ya maka isonye n'ọtụtụ ihe. Ndị ogbo ya na-azụ obere ụgbọala mara mma nụdị dị iche iche mana ndị ma ochie dịke a bụ nwa afọ Enugwu steeti kwuru na ụgbọala na-amasịkarị ya bụ ndị nnukwu Bekee kporo 'bus' maọbụ 'coaster.' O nweghị ihe na-adị n'ụlọ ị gaghị ahụ n'ime ụgbọala Chiwetalu Agu. Ihe ị ga-ahụ n'ime ụgbọala ya gunyere; ite, oche, uwe, akupe, akpụụkwụ na ihe ndị ọzọ e ji ebi ndụ ya. Chiwetalu Agu na-ebi ndụ ya dịka onye nze;ọ na-ajụgbu ajụgbu tupu ya erie. Ndị ma ya ọfụma kwuru na ọ naghị eri nri na ya ahụla nri dịka e rie ebe ha na-eme ihe ejije (set) ọ naghị eso eri nri e siri ndị ndị na-eme ihe ejije. Onye ahụ achọghị ka akpọ aha ya sịrị, ""Mgbe ụfọdụ, ọ na-eji aka ya esi nrị ọ na-eri ebe a na-eme ejije.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-58835078 +sports Zeke Nnaji: Etu m si soro na ndị ọkaibe n'egwuregwu 'Basketball' "Zeke Tobechukwu Nnaji bụ otu n'ime ndị ntorobịa a kpọpụtara aha ha dịka ndị ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ nkata na mba Amerịka. Ụmụ Naịjirịa asatọ so na ndị a kpọpụtara aha ha dịka ndị ga-esonye n'otu dị icheiche na ""National Basketball Association"". Tobechukwu kọọrọ BBC Igbo etu o si malite ịkụ bọọlụ nkata oge ọ dị obere. Nna Tobechukwu, bụ Afam Nnaji, gwara anyị na ya onwe ya gbakwara bọọlụ oge ọ na-eto eto, mana o jighi ya gaa n'ihu. Ugbua, Nnaji bụzi onye nkuzi nwa ya nwoke bụ Tobechukwu. Ha kwuru na ha na-atụ anya ịzụlite ọtụtụ ndị na-eme egwuregwu na Naịjirịa." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-55093122 +sports Samuel Chukwueze: UEFA ahọpụtala ya n'ime ntoroọbịa 50 a ga-elebara anya n'Europe "Otu na-elekọta egwu bọọlụ na Yurop bụ ""Union of European Football Associations (Uefa)"" ahọpụtala Samuel Chukwueze nke Super Eagles n'ime ndị na-etolite etolite ụwa niile kwesịrị ilebara anya. Chukwueze dị afọ iri abụọ (20) na-agbara otu egwu Villarreal bọọlụ, ka ọba ozi ndị Uefa gbara afa na o so na ndị a na-atụ anya ga-eme nke ọma n'afọ egwuregwu nke 2019/2020. Ya bụ nwaamadị so Super Eagles nke Naịjirịa gbaa asọmpi Africa Cup of Nations (Afcon) nke 2019 n'Ijipt, ebe o so ha nata ọlanchara ka ha gbara ndị nke atọ. Ka ọ na-agbara Villarreal, Chukwueze enyerela ndị otu ha aka site na inye goolu ise n'asọmpi iri abụọ na isii ọ gbarala. Uefa kwuru na ha tụrụ anya na Chukwueze ga-eme karịa ka ọ mere n'ọdịnihu. Ndị ọzọ a gụpụtara aha ha na ya bụ ọbaozi gụnyere Yunus Akgün (TUR, 19 - Galatasaray), Benoît Badiashile (FRA, 18 - Monaco), Rhian Brewster (ENG, 19 - Liverpool) na ndị ọzọ. Chukwueze bidoro egwu bọọlụ ya n'otu Diamond Academy ma sorokwa nye otu goolu n'ime goolu abụọ Super Eagles ji merie Saụt Afrịka n'asọmpi Afcon nke 2019. Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49188775 +health Coronavirus in Nigeria: Onyeisi NCDC anọrọla na 'quarantine' Akụkọ ndị dị mkpa taa: Onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Chike Ihekweazu anọrọla na 'quarantine'. Ihekweazu gwara BBC na ọ bụ ya ji aka ya wezụga onwe ya n'ọha n'ihi na ya si mba Chaịna lọta n'ọdị nso a. O kwukwara na ihe ya ji wezụga onwe ya bụ iji kee nkwụcha dịka o kwesịrị. Ọ gara n'ihu kwuo na ya ga-anọ n'ime ụlọ abali 14 tupu mmekọ ya na ndị mmadụ amalitekwa. Na mkparịta ụka ahụ, Ihekweazu kwuru na ụlọọrụ ya na-agba mbọ ịhụ etu a ga-esi hibe. Ndị ekperima atọrọla onye ụkọchukwu ụka Katọlik na Benue steeti. Aha ụkọchukwu a bụ David Echioda. Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Punch si kwuo, ọ bụ n'ụbọchị Sọnde ka ya bụ ihe mere. Onyeisi mgbasa ozi ndị Katọlik na Benue bụ ụkọchukwu John Okopupu kwuru na Fada Echioda si n'ebe ọ gara kaa ụka na-alọta oge ndị ekperima ahụ tọọrọ ya. Fada Okopupu kwuru na ndị ahụ akpọbeghị onye ọbụla iji kwuo ihe a ga-eme tupu ha atọpụ Fada Echioda. N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Benue steeti bụ Catherine Anene gwakwara ndị ntaakụkọ na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu. Mana o kweghị ekwu ihe ọbụla ọzọ gbasara ya. Nke a abụghị mbụ nke ọ na-abụ nke abụọ a na-atọrọ ndị ụkọchukwu ụlọụka dị icheiche na Naịjirịa. Ụdị ihe a emeela n'Enugwu, Kaduna, Adamawa. N'ụbọchị Sọnde, abalị mbụ nke ọnwa Maachị, ndị Bishọp ụka katọlịk mere ngagharị ekpere n'Abuja n'ihi ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ na Naịjirịa. Ha tikwara iwu ka ndị Katọlik niile yie akwa ojii n'ụbọchị 'Ash Wenezde'. Ndị ụka ndị ọzọ dị icheiche e mekwaala ngagharị iwe gbasara oke ogbugbu, ntọ na ohi nke dịka ọ na-abawanye na Naịjirịa ugbua. Abụbọọrụ ndị dọkịta n' ụlọọgwụ Esut Teaching Hospital Parklane abaala ụbọchị abụọ ụbọchị Tuzde.Ndị dọkịta ahụ a kpọrọ 'Resident doctors' na bekee kwuru na iwe ha bụ na anaghị akwụ ha ụgwọ ọnwa ziri ezi ya na orubere ja ndị ọzọ nke mere ha jiri bagide abụbọọrụ ịdọ aka na ntị nke ụbọchị ise.Mgbe BBC batara n'ụlọgwụ Parklane, ọtụtụ ndị ahụ na-aya kwara arịrị na ndị dọkịta na else ndị mmadụ ahụ pere mpe n'ihi ya bụ abụbọọrụ.Otu nwaanyi bụ Benedicta Ugwu gwara BBC na ka mgbe ụnyịahụ ka ya bịwara ụlọ ọgwụ mana rule tata ya ahụbeghi dọkinta.Ụfọdụ ebe dị ka Accident and Emergency bụ ebe ndị Resident dọkinta na eju eju bụ nani dọkinta ndị isi old ma old nọ na ya.Onye dọkinta bụ Consultant gwara anyị na ha bụ ndị isi jisiri ike na arụ ya bụ ọrụ sọsọ ha, ma yọọ gọmenti ka otinye anya na ihe ndị out ha na ana ha ka were nwee ikebido ọrụ ọzọ.Permanent Secretary na ministri nke ahụike n'Enugwu adịla na mbụ katọọ abụbọ ọrụ ndị Rrsident dọlinta ahụ.Ministri ahụ kwuru na ha ekwesighị ịgba abụbọ ọrụ ugbua a na-alụ ọgụ Lassa Fever nakwa corona virus tinyekwara na ha gara ya bụ ihe na mberede na agwaghị gọmenti n'oge.Ministry ahụ kwuziri na onye ọbụla nwụrụ na Parklane n'ihi abụbọ ọrụa, na ọbara ya ga-adị ndị Tesident dọkinta n'isi. Ndị ụlọomeiwu nta nke Naịjirịa ekwuola na ha ga-aga ezumike izuụka abụọ. Nke a bụ iji nye ohere ka e tinye ihe ụfọdụ ga-enye aka igbochi mgbasa ọrịa coronavirus n'ogige ha. Ha rịọkwara ka ndị ọ dị n'aka gbasie mbọ ike ịchụpụ ajọ ọrịa na Naịjirịa. Mmadụ 23 ebutela coronavirus n'ụlọomeiwu ndị Iran. Iran nwere ndịomeiwu mmadụ 290, nke a pụtara na otu onye n'ime mmadụ iri n'ụlọomeiwu ahụ bu ya bụ ọrịa. Ewepụ Chaịna, Iran bụ mba nke abụọ ebe coronavirus kacha gbuo mmadu, ma bụrụkwa mba nke atọ kacha nwee ndị bu ọrịa ahụ. Otu egwuregwu bọọlụ Chelsea na Liverpool ga-achịpụ ya n'abalị taa bụ Tuzde iji mata onye ga-agafe n'agba nke ọzọ nke asọmpi FA cup. Otu abụọ a agbaala ọnyụpa n'ọdị nso a. Cheta na Watford zọpịasirị Liverpool ka awarawa tomanto n'ụbọchị Sọnde, ebe Mmanya ngwọ ndị Chelsea agbọghị ụfụfụ na be Bournemouth. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51728536 +religion Mbaka: Fada Cajetan abụghịzị enyi Adoration Ministry n'ihi mkparịtaụka BBC Igbo "Ọnụ na-ekwuru Adoration Ministry n'Enugwu bụ Maximus Ugwuoke agọọla na awakpoghị ndị ntaakụkọ BBC n'ogige ụbọchị Wenezde. BBC kwuburu na ụmụnwoke dị iri abụọ wakporo ha n'ihu Fada Mbaka, ka ya bụ Fada ji aka ya na-adụ ya aka n'ọnụ ma na-akpọ ya aha ọjọọ. Fada Obiekezie bụ onye dubara ha ịgba Fada Mbaka ajụjụọnụ. Maazị Ugwuoke n'okwu ya sị na akụkọ mwakpo a bụ akụkọ ""nkata a kpara iji mechu aha Fada Ejike Mbaka ma meekwa ka ndị mmadụ na-asọpụrụ ma na-ahụ n'anya."" N'ime akwụkwọ mgbasaozi o binyere aka, Ugwuoke dere na Fada Obiekezie abụghị enyi Adoration Ministrị maka ajụjụọnụ ndị BBC Igbo gbara ya. Cheta na ụkọchụkwụ ụka Katọlik n'Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka na ndị ọrụ ya kụrụ ndị ntaakụkọ BBC Igbo mmadụ abụọ nakwa ọkwọụgbọala ha ihe tinka kụrụ pan ma nara ha ekwentị ha na ngwaọrụ ntaakụkọ ha n'ogige Adoroation Mbaka n'Enugwu. Etu Mbaka na ndị na-eso ya siri wakpoo ndị ntaakụkọ BBC n'Enugwu Obianinwa, Agbanelo na ụkọchukwu du ha bụ Rev Fr Cajetan Obiekezie gara n'ogige 'Adoration Ministry Enugwu' ịgba Mbaka ajụjụọnụ oge a wakporo ha. Ndị ọzọ so gaa njem a bụ Ndubuisi Nwafor, bu ọkwọụgbọala nakwa onye enyemaka Fada Obiekezie bụ Solomon Orakam. Ọ bụ n'elekere iri nke ụtụtụ ka ndị ruru ụlọ ụka Mbaka. Dịka Obianinwa bụ onye ntaakụkọ anyị duru ndị ọzọ gaa ya bụ ije si kọwaa, ""nke a mere dịka ha chere Mbaka ihe ruru awa atọ."" ""Ọ bụ n'elekere ise nke ehihe ka ha niile si ụlọụka ahụ gawa be Mbaka ịgba ya ajụjụ ọnụ a."" Obianinwa sịrị: ""Anyị bịara ịgba Fada Mbaka ajụjụ ọnụ n'Adọration (oge ekpere na-aga), mana ọ gwara anyị ka anyị gaa n'ụlọ ya nke dịkwa n'ogige ahụ chere ya. ""Anyị chere ọtụtụ awa tupu ya abịakwụte anyị, ma gbanwe, bido na-egosi iwe, sị na anyị dere akụkọ ọjọọ banyere ya."" ""Fada Mbaka nyere ndị okorobịa ya iwu ka ha nara anyị igwe e ji ese onyonyo na ekwenti anyị ma tie anyị ihe."" Obianinwa siri na ndị a Mbaka kpọtara yiri ha egwu ma sị na ha ga-egbu ha maka ide akụkọ megidere Mbaka. Onye ntaakụkọ BBC sị na oge ndị a na-aba mba, Mbaka na Obiekezie si n'ime ụlọ ebe ha nọ pụta were tụwa ya aka n'ihu na-akpọ ya ""satanic"". Ọ sị: ""Ọ bụ mba Mbaka na-aba mere ka ndị okorobịa malite bawa oke mba ma majawa ha. ""Ha sepuru ""wig"" m kpu n'isi ma tọdo Agbanelo n'olu. Fada Obiekezie bịara isi ka ha kwụsị mana ha wakporo ya ma nara ya ekwenti ya."" Obianinwa sị na ọ bụ oge ya malitere iti mkpu na ""ụwa ga-anụ na ọ bn̄ụ na be Mbaka ka egburu ndị ntaakụkọ BBC"" ka mwakpo a kwụsịrị. Obianinwa sị: "" Ọ bụ ugbua ka Mbaka sị ka anyị pụọ tupu ndị otu ya egbuo anyị. Ọ gwara ha nye anyị ngwa ọrụ anyị. Ha chụpụrụ anyị n'ebe ahụ. Ndị otu ya so anyị n'azụ ruo oge anyị hapụrụ Enugu ịchọ ọgwụgwọ na enyemaka ndị uweojii."" Ha mechara nyeghachi ha igwe onyonyo ahụ na ekwentị ma dupụ ha n'ogige ha dị n'Emene. Fr Obiekezie kwukwara otu ihe ahụ. Ọ gwara BBC Igbo na ya gara gwa Fada Mbaka isi ije ndị BBC. Ọ sị na Mbaka kwere nkwa na ọ ga-aza ha ma o mecha adọration mana ọ tụgharịrị gosiwa ha iwe."" Fr Obiekezie, sị na ya bụ enyi Mbaka, na BBC Igbo nweburu mkparịtaụka ebe ọ katọrọ Mbaka maka ụfọdụ okwu ndọọndọọ ọchịchị ọ na-etinye ọnụ na ya, nke o kwuru na o kwesịghị ekwesị. Father Mbaka bụ ụkọchụkwụ ụka Katọlịk a ma ama na Naijiria maka amụma ọ mara tupu Ntuliaka 2015 na Muhammadu Buhari ga-emeri aka na-chị Naijiria oge ahụ bụ Goodluck Jonathan. Maazị Ugwuoke sị na Mbaka Adoration Ministry akpọghị BBC ịbịa ịgba Mbaka ajụjụ ọnụ; mana ndị ntaakụkọ BBC sị na onye du ha gaa ebe ahụ gwara Mbaka na ha na-abịa. Akwọkwọ mgbasaozi o wepụtara sị na ndị BBC batara ka ndị amaghị ndi ha bụ ma na-esi onyonyo na nzuzo, mana ndị ntaakụkọ BBC kwụsịrị ike na ha emeghi etu a ma ncha. Akwụkwọ ahụ sịka na Fada Obiekezie bụ bụ onye ya na Adoration Ministry adịghị na mma naka mkparịtaụka ya na BBC mere." https://www.bbc.com/igbo/afirika-55252934 +politics Simon Ekpa: Ihe mere m jiri sonye n'atụmatụ ịchọ nnwereonwe Biafra BBC Igbo na Simon Ekpa onye Nnamdi Kanu nyebụrụ ikike ka ọ gbasa ozi na Redio Biafra nwere mkparitaụka n’ụbọchị Fraịde ebe o kwuru okwu nwere onwe ndị otu Ipob na etu o si metụta ndị Igbo na ndị ọnwụwa anyawụ nịịle. O kwuru ihe ole na ole nke gụnyere : https://www.bbc.com/igbo/afirika-58358934 +politics Gani Adams: Lee ihe o kwuru maka referendum na Yoruba Nation "Onye ndu otu Odua People's Congress a ma dịka OPC bụ Gani Adams agwala onyeisiala Muhammadu Buhari ihe ndị Yoroba chọrọ n'aka ọchịchị ya. Adams kpọrọ oku ka ọchịchị Buhari nye ndị Ọdịda Anyanwụ nnwereonwe maọbụ kweta na nhazigharị Naijiria na mpaghara na mpaghara dịka ndị gọvanọ mpagahara ahụ siri chọọ. Gani Adams kwuru nke a n' Oshogbo, isiobodo Osun steeti ụbọchị Tọzde n'ọgbakọ ndị ndu otu Osogbo. ""Anyị agaghị anwụ n'ụbịam maọbụ biri dịka ohu n'ala anyị."" ""Anyị kwụ na ihe ndị gọvanọ Ọdịda Anyanwụ kwuru maka nhazịgharị ọchịchị na mpaghara na mpaghara."" "" Anyị dịka ndị na-alụ ọgụ nnwereonwe ga-alụ ọgụ ahụ rue n'isi. ọ bụghị etu ahụ, opekata mpe, enye anyị 'restructuring.' Ọ gwara Buhari ka ọ hazie referadum ka ndị Yoroba tụọ vootu kwuo nke ha chọrọ; ịnọrọ onwe ha ka ọ bụ nhazigharị Naijiria na mpaghara. Gani Adams , onye bụ ""Are Ona Kankanfo"" nke pụtara ""ọchịagha nke ala Yoroba,"" gara n'ihu kwuo na, ma e tere ogiri, ma e tere ụgba, na ya nọ kwụsịrị ike n' ịlụrụ ndị Yoroba ọgụ mana na ọ bụghị n'ụzọ tigbuo-zogbuo." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58188728 +business Ihe iri ị ga-eme iji chekwatụ ego gị maka ọdịnihu "Ndigbo na-ekwu n'okwu sị, ""a na-eri akụ, akụ a na-abịa"", na nke onye riri ka o bu ala, mana nke bụ eziokwu bụ na nwata na-ata akara na-ata ego ya. Ọ dị mma mmadụ inweta onwe ya n'ihi na ogbu opi na-ehicha imi, mana onye ara kwesịrị iji uche ya. Ọtụtụ ihe ị na-eme kwa ụbọchị, izu, maọbụ ọnwa iji nweta onwe gị nwere ike ịbawa gị ọgaraanya maọbụ gpapeere gị ụzọ ime ihe na-atụ n'anya ma ọ bụrụ ma ị tụlee ya. BBC Igbo jụrụ ndị mmadụ na-eso anyị na Facebook ajụjụ ihe ha na-atụnye ego iji mee onwe ha obiụtọ na ihe ọ na-eri ha n'izu. Ọtụtụ kwuru na ihe na-amasị ha gụnyere ịṅụ manya 'beer', mmanya ọtọbịrịbịrị, nkwọbi, azụ ndụ amịrị amị, 'data' e ji aga n'ịntanetị nakwa ego e ji akpọ ekwentị. Ndị ọzọ gụnyere mịchacha mịchacha jụrụ oyi (ice cream), 'pizza,' anụ ọkụkọ, abacha, ịgba chacha (sport betting) nakwa ịga sịnịma wdg. Ihe ndị ụmụnwoke kwuru gosiri na ọtụtụ n'ime ha na-etinye ego na nkwobi, mmanya na ihe oriri ndị ọzọ, ebe ụmụnwaanyị na-etinye ego n'akpụkpọụkwụ, akwa nakwa ịkpa isi. Anyị gbakọrọ ihe mmadụ ole na ole n'ime ha na-atụnye n'ịtụ ndụ mmanụ n'otu izuụka inweta ihe ọ na-eri ha n'ọnwa, n'afọ nakwa ihe ọ ga-eri ha n'afọ iri. Mazi Ezenwa Don kwuru na nkwọbi na ụgba na ihe ndị so ya na-efu ya puku naịra ise kwa izu. Nke a pụtara puku naịra iri abụọ (N20,000) n'ọnwa, puku narị abụọ na puku iri anọ (N240,000) n'afọ nakwa nde naịra abụọ, puku narị anọ (N2,400,000) n'afọ iri. Ezenwa mụbaa ego a ugboro abụọ, ọ ga-eji ya rụọ ụlọala nwere ọnụ ụlọ atọ ma ọ bụ anọ. Lee etu ọ ga-esi mee nke a n'ime akụkọ a : I nwere ala? Lee ihe ọ ga-eri gị ịrụ ụlọ aka gị Blessing Adannaya kwuru na ""ana m eji ego m azụ data"" ma kwukwa na ọ na-eri ya puku naịra atọ na narị ise (N3,500). Ihe nke a pụtara bụ na n'otu ọnwa, Adannaya na-atụnye puku iri na anọ (14,000) tụnye puku narị na puku iri isii na asatọ (N168,000) n'otu afọ, ebe ọ ga-eri ya otu nde naịra na puku narị isii na iri asatọ n'afọ iri. Lee mgbakọ ihe itoolu ndị mmadụ na-atụnyekarị ego iji nweta onwe ha n'afọ: Ọtụtụ na-eche na ọ bụ naanị ọgaranya na-erifọ nke ọ ga-edowe echi. Mana onye nhazi ego onye doro anya (personal finance expert) bụ Uche Iheanacho na-ekwu na 'ihe ọ masịrị gị na-enweta dịka onye na-arụ ọrụ maọbụ onye na-azụ ahịa, onye ọbụla nwere ike iwepụta ego ọ na-edokwa, opekatampe otu ụzọ n'ụzọ iri maka echi."" I nwere ike ị na-achị ndị ọkpa akụ eri eri ọchị mana ị ma na o nwere ihe ị ga-amụta n'aka ha dịka o siri gbasa ichekwa ego gị, maka ebumnobi dị mkpa. Lee ndụmọdụ ga-enyere gị aka maka ichekwatụ ego gị maka ọdịnihu: 1. Welata ego ị na-emefu n'oriri na ọṅụṅụ ma tinye ya n'ihe ga na-ewetara gị ego. 2. Zụọ ihe ụfọdụ ị chọrọ ịzụ oge o bere ego (promo, bonus, sales) ma tinye ego ahụ ị gaara emefu n'ụsọ maka nchekwa. 3. Zuo 'kolo' na-etinye ego kwa ụbọchị maọbụ izu. O ruo ọnwa atọ maọbụ isii were ego ị tụkọtara tinye n'ụlọakụ maka nchekwa. 4. Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ bekee maọbụ i na-etinye ego i nwetara n'ụlọakụ, sonye n'atụmatụ ka a na-ewepụ ego n'akpaego gị maka nchekwa oge ọbụla ego batara ya. 5. Akpụkpọụkwụ nwere saịzị. Hapụ ile ndị ọzọ anya ka ị dị ka ha dị n'ihi na ị maghị ihe na-etiri onye egwu. Ani dụrụ ọdụ, ""Ọ bụghị ihe niile gbara n'ahịa ka ị ga-azụ."" ""Kama ịzụ ekwentị iPhone 6, zụọ nke nwere ike ịrụkwara gị ọrụ ọ ga-arụ dịka Samsung."" 6. Kama ịga 'jọint' ṅụọ mmanya, zụrụ mmanya ahụ laa, ṅụọ ya n'ụlọ gị. 7. Kama ịga n'ezi gaa ile 'Premier League', were mefuo oke ego ịzụrụ onwe gị na ndị enyi gị mmanya, zụọ 'subscription' lee bọọlụ n'ụlọ gị na-ezinaụlọ gị. 8. Tupu ị zụọ ihe, chee uru ọ ga-abara gị na ọghọm ọ ga-eweta tupu ị zụọ ya. 9. Jụọ onwe gị, ihe ahụ na-agụ gị, ọnwa ole ka ị ga-arụ ọrụ tupu i nweta ego ihe ahụ anya gị dị na ya? 10. Chọọ ahịa ebe a na-ere ihe ahụ ị chọrọ izụ ọnụ dị ala. Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49425534 +politics "Gịnị bụ ""Stay Execution of Judgement"" high court nyere Dave Umahi?" "Ọkaikpe Inyang Ekwo akụchapụla akwụkwọ Dave Umahi tinyere iji rịọ ka a hapụ ya n'ọkwa dịka Gọvanọ Ebonyi Steeti. Cheta na ọkaikpe Ekwo nyeburu iwu n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Maachị 2022, wee chutuo Dave Umahi na osote ya bụ Kelechi Igwe, n'ihi na ha hapụrụ pati PDP ebe ha nọrọ merie ọchịchị banye APC. Mkpebi ahụ metụtakwara ndị Omeiwu Ebonyi steeti niile so Umahi pụọ na PDP banye APC. N'oge ụlọikpe nyechara mkpebi a, ọkaiwu Umahi bụ Chukwuma Machukwu Umeh, rịọburu ọkaikpe Inyang Ekwo ka o nye ohere ka Umahi nọgide n'ọchịchị ruo oge ụlọikpe mkpesa ga-ekpebi ya bụ ikpe. Mana taa bụ Mọnde, Maachị 21, ka ya bụ ọkaiwu Chukwuma Umeh gwakwara ọkaikpe Inyang Ekwo ka ọ wezụga ya bụ arịrịọ ha rịọbụrụ sị ya ka ọ hapụ ha n'ọchịchị. Umeh rịoburu ụlọikpe ahụ arịrịọ ka ọ hapụ Dave Umahi na Osote ya bụ kelechi Igwe n'oche ọchịchị rụọ mgbe ụlọikpe mkpegharị kpebiri ikpe ha. Ọ kọwara na ebe ọ bụ na ha agbaala akwụkwọ mkpesa n'ụlọikpe 'Appeal Court', ọ dịzighị mkpa ka ya bụ okwu na-aga n'ihu n'ụlọikpe 'High Court'. N'ihi nke a, ọkaikpe Inyang Ekwo kụchapụrụ ya bụ ikpe. Okaiwu Ikechukwu Nwabufo kọwara BBC Igbo ihe atụmatụ 'Stay Judgement of execution'. O kwuru sị, ' Mgbe ọkaikpe kpebiri ikpe, onye e kpere ya bụ ikpe n'isi nwereike ị ga-tinye akwụkwọ n'ụlọikpe a ka ha kwụsị ime ihe ya bụ ikpe kpebiri'. O kwukwara sị, 'Tupu ha ga-eme nkea, ha ga-aga n'ụlọikpe ka ebe e kpere ya bụ ikpe were tinye akwụkwọ mkpesa maka ikpe ụlịọkpe nke nta kpere ha'ụlọikpe nke kpere ya bụ ikpe. Dịka Umahi gara n'ụlọikpe mkpesa were kpesa ikpe nke ụlọikpe elu kpere n'isi ya. Nwabufo kọwara sị, ""Atụmatụ a bụ ihe a na-akpọ 'Stay execution of Judgement' "". Kama ọ rụtụrụ aka were sị, 'tupu emee mkpesa a, a ga-enwerịrị isiokwu siri ike ha ga-agbado ụkwụ were mee ya bụ mkpesa'." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60822360 +religion Aka akparala Pastọ zoro ọtụtụ ụmụaka n'ime ụlọụka ya "Aka ndị uweojii akparala otu Pastọ e boro ebubo izo ọtụtụ ndị mmadụ n'ime ụlọụka ya, ọtụtụ n'ime ndị a bụ ụmụ ntakịrị. Ndị uweojii Ondo steeti kwuru na ọ bụghị naanị ụmụ ntakịrị ka a chọpụtara e zoro n'ime ụlọụka ahụ. Ọ bụ na mgbede abalị ụbọchị Fraịde, Eprel 1 ka ndị uweojii mere nchọpụta a, na mpaghara a kpọrọ Valentino na 'Ondo town'. Funmilayo Odunlami bụ ọnụ na-ekruru ndị uweojii Ondo steeti kwuru na ha kpọpụtara mmadụ iri asaa na asaa (77) n'ime ụlọụka ahụ. Ndị uwoji kwuru na Pastọ a na-agwa ndị ụka ya na oge eruola mgbe ụwa ga-emebi. Dịka Odunlami si kwuo, ""ụkọchukwu ahụ na-akụziri ndị otu ya na ụwa a ga-abịa n'isi njedebe n'ọnwa Sepụtemba afọ 2022."" ""Nke a mere ha ji kpọchide onwe ha ụzọ n'ime otu nnukwu ọnụụlọ dị n'okpuru ụlọụka ha iji na-akwado ma chere mmebi ụwa."" ""Ọtụtụ n'ime ndị a hụrụ n'ime ụlọụka ahụ bụ ndị ji aka ha hapụ ụlọ ha kamgbe ọnwa ise gara aga."" Ndị uweojii kwuru na ha amalitela nnyocha miri emi gbasara nke a. Cheta na ụdị ihe di otu a emebuola n'ọdị nso a n'Ekiti steeti ebe otu Pastọ aha ya bụ Noah Abraham na-ana ndị ụka ya ego dị narị puku naịra atọ (N300,000) iji duga ha eligwe. Ndị uweojii nwuchiri nwa amadị ahụ n'ọnwa Mee afọ a." https://www.bbc.com/igbo/articles/c99lx2z1n5yo +health World Blood Donor Day: Tupu inye mmadụ ọbara, buru ihe ndị a n'obi Ọbara bụ otu njirimara onye dị ndụ. Kama ụfọdụ ọrịa na ihe mberede na-eme ka ọbara nọ n'ahụ mmadụ pee mpe. Akụkọ a ga-akọwara gị mkpa ọ dị na ndi mmadụ nyere ọbara ha n'efu iji zọọ ndụ ndị mmadụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-57482799 +health Coronavirus Tips: Tupu ị pụọ n'ezi, gbaa mbọ jide ihe anọ ndị a Ọ bụ eziokwu na gọọmentị emepeela obodo ka ndị mmadụ kpagharịwa, mana ị kwesịrị ị na-echekwa onwe gi oge niile. Ihe anọ dị mkpa ị kwesịrị iji oge niile gunyere: https://www.bbc.com/igbo/52566708 +business Ọgba Mbọ: Lee Afam Dozie, onye na-akpọlịte ụgbọala mgbe ochie n'ọnwụ "Igbo na-atụ ilu sị na 'ihe onye na-eme ka ekwe ji akpọ ya'. Nke a bụ eziokwu na ndụ Afam Doze, nwa amadị e ji ịkpọlite ụgbọala ochie nke ndị mmadụ che na ọ nwụọla n'ọnwụ. Dozie gwara BBC Igbo na ya malitere ịhụ ọrụ ụgbọala n'anya oge ọ bụ nwata, maka na nna ya bụkwa ọrụ ahụ ka ọ na-arụ. O kwuru na ọ bụ oge o lelere onyonyo otu onye mba Amerịka na-emegharị ụgbọala ochie, ka ya onwe ya nwere mkpalite na mmụọ ya ịbanye ya bụ ọrụ nke ọma. Ugbua, Dozie so n'otu n'ime ndị a kacha mara na Naịjirịa na-agbanwe ụgbọala ochie, mee ya ka ọ dịkwa ka nke ọhụrụ. ""Ebumnobi m bụ na n'oge adịghị anya, aga m enwe ike ịrụpụta ụgbọala nke aka m site n'isi mbido ruo na njedebe,"" Dozie kwuru. Kirie mkparịtaụka a n'uju. Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Vining Ogu." https://www.bbc.com/igbo/articles/crgzkle49r7o +politics Inec certificate of return: Ademola Adeleke anatala asambodo irigo n'ọkwa gọvanọ Osun "Ụlọọrụ Independent national electoral commission (INEC) enyela Ademola Adeleke meriri ọkwa gọvanọ n'Osun steeti asambodo nyere ya ikike ịnọdụ n'ọkwa ahụ. Osote ya bụ Kola Adewusi natakwara asambodo nke ya. N'otu mkparịtaụka Ademola na ụlọọrụ Channles tv nwere na nso nso a, Adeleke kwuru na gọvanọ Adegboyega Oyetola akpọbeghị ya kelee ya dịka ọ ka na-eche ịza ekwenti ya. Mana onyeisiala Muhammadu Buhari bụ onyeisi APC Oyetola nọ akpọla Adeleke ma kelee ya. Govnor Gboyega Oyetola nke Osun steeti na-akwado ịpụ n'oche adịla njikere ịma mpụtara ntụliaka gọvanọ a ka mechapụrụ na steeti ahụ nke Ademola Adeleke meriri. Kunle Adegoke, bụ ọkaiwu Senior Advocate of Nigeria (SAN) kwupụtara na gọvanọ Gboyega Oyetola gwara ya na ndị ọkaiwu ruru iri ise egosila mmasị ha ịma mmeri Senator Ademola Adeleke aka n'ụlọikpe ntụliaka. Adegoke kwuru na na ha kpụga mpụtara ntuliaka ahụ ụlọikpe maka ọtụtụ mkpesa gbasara nrụrụaka na ya bụ ntụliaka. O na-ekwusi ike na ha na-eche na ndị na-akwado PDP mere nrụrụaka na ntụliaka mere na July 16 , 2022. Adeleke ji ọkọlọtọ Peoples Democratic Party (PDP) meriri Oyetola na ndị ọzọ so zọọ ọkwa ahụ na ntụliaka gọvanọ steeti ahụ mere na Julai 16, 2022. Nke a na-abịa dịka ụlọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) nyere ya asambodo ịbụ gọvanọ taa bụ Jụlai 20, 2022. Adeleke ji vootu ruru 403,371 wee merie Oyetola nke APC nwetere vootu 375, 027. Etu Ademola Adeleke si bụrụ gọvanọ Osun steeti Ụlọọrụ Inec akpọpụtala aha Ademola Jackson Adeleke nke PDP dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti. O nwetara ngụkọta vootu 403, 371 iji merie Adegboyega Oyetola nke APC nwetara 375, 027. Lee etu o si merie ebe a: Ka ọ dị ugbua, amalitela ịgụ vootu na-ebe ụfọdụ na ntuliala ndị Gọvanọ n'Osun steeti. Ebe BBC hụrụ ihe dị otu ahụ ugbụa bụ na Ward 1, Unit2,Ibosini, Ilesha nakwa Ward 8, Unit 4,Odo/Esira, Ilesha, A tụchaala vootu na atụmvootu na-aga n'ihu n'Osun steeti maka ihọpụta ndị ọchichị steeti ahụ. Inec kwuburu na-atụmvootu ga-amalite mgbe o ji ọkara gafee elekere atọ nke ụtụtụ, mechie ma o jiri ọkara gaa elekere abụọ nke ehihie. Mana ha kwuru na onye ọbụla nọ n'ahịrị mgbe ahụ ga-atụrịrị vootu. Ka nke a na-eme, kepukepu maka ịzụ vootu ka na-aga n'ihu na steeti ahụ ebe ndị ọrụ anyị na-ekwu na ya bụ akaazụ kpụ ọkụ n'ọnụ ebe ahụ. Ha kwuru n'Olorunda ward 8 unit 21 na ndị mmadụ ndị mmadụ na-ana ihe dịka N5000 ruo N10,000 maka ịre vootu ha. Onye ntaakụkọ BBC hụrụ ebe ndị mmadụ gakwuuru mmadụ abụọ kwu n'akụkụ sị ha, ""anyị emeela ịhe ịchọrọ, kwụọ anyị ụkwọ anyị"". Otu nwoke na-anọchite anya otu pati na-achọghị ka akpọọ aha ya sị na ""oteelarị ha malitere ịre nakwa ịzụ vootu kemgbe ụtụtụ. Otu ihe ahụ na-akpọtụ na Ilesha ebe otu onye gwara BBC na a kwuru ya naịra puku isii (N6000) maka vootu ya. N'agbanyeghị, ndị mmadụ siri ọnwụ buru mmiri na-ezo kwuru ka ha hụ na ha tụrụ vootu ha. Igobi vootu nke ndị Bekee kpọrọ 'vote buying' bụ otu ụzọ a na-ejikarị eme mpụ na ntuliaka na Naịjiria. Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe a gbakọrọ ịtụ vootu n'Osun steeti nụrụ ebe otu nwaanyị na-akpọ ndị mmadụ n'ekwentị ka ha bịa tụọ vootu na ""ego dị ebe a"". Ka o rutere na Unit 14 wọọdụ 4, Ataoja D dị n'Oshogbo, ọ hụkwara ebe ụfọdụ ndị nnọchiteanya ndị pati kwụ na-achọ ndị ha ga-agwa ka ha tụnyere ha. Otu nwaanyị na-achọghị ka a kpọọ ya aha bịakwutere onye ntaakụkọ BBC gwa ya ka o nyere ya aka chụpụrụ ya ndị pati ahụ n'akụkụ ebe ha na-atụ vootu. N'olu ya ""Ndị pati a na-enye ndị mmadụ nsogbu na-amanye ha ka ha tụnyere ha. Ụfọdụ dị ka ndị merela okenye nwere ike jiri ụjọ na-atụnyere ndị a sị ha tụnyere, mana anyị bụ ndị ntorobịa na-atụnyere onye anyị bu n'obi."" Mgbe onye BBC gakwuru ndị uweojii nọ ebe ahụ ịgwa ha maka mkpesa a e kpesaara ya, ha gwara ya na nke a karịrị oke ha ga-emeli, n'ihi na e nwere ""ụmụokorobịa ọjọọ"" na-agbakọ n'akụkụ ha. Ka nke na-eme, a kuriela otu igbe e ji atụ vootu na unit 11, ward 7 dị na Kajola, nke dị n'okpuruọchịchị Atakumosa, Osun steeti. Akụkọ kwuru na ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ bịara tiwe ndị mmadụ ihe ebe ahụ. Ndị nọ ebe ya bụ ihe mere sị na ndị oji egbe ahụ bịara tiwe ndị ahụ ihe aghara aghara na-ekwughị ihe ha mere. ""anyị maghị ebe ha kpụ ha awa"". ihe a mere ndị mmadụ na ndị ọrụ pati malite irụụka nke mere ọgụ jiri daa ebe ahụ, ha jiri dọsa igbe vootu. Ha tiri onye uweojii nọ ebe ahụ bịara igbo ọgụ ihe. ""Nke a mere onye uweojii ahụ jiri kpọọ ibe ha"", ka o kwuru. Onyeisi Inec streeti ahụ bụ Abdulganiyu Raji agaala ebe ahụ iji anya hụ ihe mere. Gboyega Oyetola bu gọvanọ Osun steeti atụọla vootu n'ọgbọ nta ya dị n'Iragbiji ebe ọtụtụ mmadụ malitere ịtụ vootu kemgbe elekere asatọ nke ụtụtụ taa. Ya na oriakụ ya so bịa tụọ ya bụ vootu. Ademola Adeleke bụ onye ji ọkọlọtọ pati People's Democratic Party (PDP) azọ ọkwa gọvanọ Osun steeti apụtala tụọ vootu nke ya. Nke a bụ nke ugboro abụọ Adeleke a ma dịka 'Imole de' na-azọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ. Ndị mmadụ apụtala n'ọgbọ ntuliaka n'Osun steeti ebe ha ga-atụnyere onye ga-achị ha dịka gọvanọ n'afọ anọ na-abịa. Ndị gụnyere ndị nwere nkwarụ so pụta n'ọgbọ kemgbe ebe elekere asaa nke ụtụtụ Satọde, Julaị 16, 2022. Ndị mmadụ pụtara na-achọ aha ha na wọọdụ dị iche iche dịka ha na-akwado ịtụ ya bụ ntuliaka. Ndị ọrụ ngo Independent National Electoral Commission (Inec) pụtara n'oge n'ụfọdụ wọọdụ ma dịrị njikere ịrụ ọrụ e ji maka ya kpọọ ha oku. Akụkọ ka na-abịa•" https://www.bbc.com/igbo/afirika-62189604 +health Ear infection: Tinnitus, Otitis externa na ọrịa ndị ọzọ nwereike inye ntị gị nsogbu Kedụ ihe ị ma maka ọrịa ndị na-enye maọbụ nwereike inye gị nsogbu na ntị? Ọrịa dị iche iche nwereike inye gị nsogbu na ntị, ụdị gụnyere ụda maọbụ mkpọtụ nakwa abụ ịpụta mmadụ na ntị so n'ihe ndị na-enye nsogbu na ntị. Ụfọdụ n'ime ọrịa ndị a nwere ngwọta ebe ụfọdụ bụ ọrịa tara nchara na-enweghi ọgwụgwọ. Ntị mmadụ nwere nke Bekee kpọrọ 'middle ear' nakwa 'inner ear'. Nke mbụ bụ ebe ụda na-esi n'udu ntị ('tympanum') agaru na n'ime ntị (inner ear). A bịa n'ọrịa ntị, nke kacha emetụta ndị mmadụ ọkachasị ndị okenye bụ nke a kpọrọ Tinnitus. Anyị ga-akọwa ihe ọrịa bụ. 1) Tinnitus: Nke a bụ ọrịa ntị nke mmadụ ga na-anụ ụda maọbụ mkpọtụ na ntị ya. O nwereike ime mmadụ n'otu ntị maọbụ na ha abụọ. Ụfọdụ oge ọ na-abụ oke mkpọtụ dịka nke si n'igwe okwu (loudspeaker), mmadụ imerụ ahụ n'isi, nakwa oke anya ajụ na-ebute ya. Marakwa na mkpọtụ ahụ ị na-anụ na ntị gị n'ihi tinnitus abụghị n'okirikiri gị ka o si abịa, ọ bụ n'ime ntị gị ka o si. Ụfọdụ oge ọ na-eji aka ya alara onwe ya, mana oge ndị ọzọ ọ ga-adị mma ka onye dọkịta ntị nyochaa gị. Etu ị ga-esi agwọ tinnitus: Ụlọọrụ ahụike NHS nke mba Briten nyere usoro a maka ilekọta tinnitus Obi amapụla gị na ị nwere tinnitus n'ihi na ọ bụghị oge niile ka o gosiri na ntị gị nọ n'ezigbo nsogbu ichi. 2) Otitis (media na externa): Ọrịa Otitis na-ebu ụzọ egosi onwe ya site n'oke mgbu na ntị nakwa ebe mmiri (fluid) juru na ntị. Nje (bakteria) kacha ebute ya bụ ndị nke a kpọrọ Streptococcus pneumoniae, Haemophilus influenzae, Moraxella catarrhalis, nakwa Streptococcus pyogenes. Nke a nwereike isi na nsogbu mkpọchi imi dịka rhinitis malite. N'ihi na e nwere okporo jikọrọ azụ imi na etiti ntị (middle ear) nke Bekee kpọrọ 'Eustachian tube', rhinitis nwereike ikpalite ọrịa a n'azụ imi ma ọ bụrụ na okporo a anaghị arụ ọrụ ọfụma, nke ga-eme ka mmiri tojuo n'etiti ntị n'azụ udu ntị. Ihe na-egosi na mmadụ nwere nsogbu n'etiti ntị ya: Etu e si agwọ ya: Ndị iche dị n'orịa Otitis media na Otitis externa: Ọrịa a bụ nke na-etinyekarị mmadụ n'ọnọdụ ebe ọ dị ya ka ụwa ya ọ na-eme ntụgharị. Ọ bụ nsogbu nke ime ntị (inner ear) na-eme ka isi ejuru mmadụ. A mabeghi ihe na-ebute ọrịa Meniere a, mana a ma na ọ bụ nsogbu mfachi ntị so eme ya. Ihe na-egosi ọrịa Meniere: Etu e si agwọ ọrịa Meniere: Ọrịa a enweghi ngwọta, mana dọkịta nwere ike inye gị ọgwụ ga-enyere gị aka maka anya ajụ na ịgbọ agbọ. Ọ bụrụ na ọ na-arịa gị, o gosi gị na ọ chọwala imalite dịka ibu gị anya ajụ na ihe ndị ọzọ, ndị dọkịta NHS na-ekwu na ọ ka mma na ị wegharịghị isi gị ọsịsọ, ma were nwayọ nwayọ na-aga ije, nọrọkwa maọbụ dinara ala ruo mgbe ọ kwụsịrị inye gị nsogbu. Nke a bụ ọrịa na-emetụta ọkpụkpụ 'mastoid' dị n'azụ ntị mmadụ. Ọ bụ ụmụaka ka ọ kacha emetụta. Ihe na-egosi na mmadụ nwere ọrịa a: Etu e si agwọ Mastoiditis: Ọrịa ndị ọzọ na-emetụta ntị mmadụ gụnyere: https://www.bbc.com/igbo/afirika-57138132 +health Coronavirus Tips: 'Disinfectant' anaghị agwọ coronavirus Dịka onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Tọzde, o kwuru na ọ ga-amasị ya ma e mee nnyocha ịmata ma e nwere etu a ga-esinwu jiri disinfectant na-agwọ ọrịa coronavirus. Mana nke a mere ka ọtụtụ malite ikwu na Trump kwuru na 'disinfectant' nwere ike ịgwọ ya bụ ọrịa. Nke a bụkwa asị o. Aṅụkwala ihe ị na-amaghị isi na ọdụ ya. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chimezie Ucheagbo https://www.bbc.com/igbo/afirika-52420027 +politics Kenneth Okonkwo: 'Ọbụrụ na Labour Party gbanwee, agaghị m ahapụ ha naanị, aga m ebuso ha agha' Otu n'ime ndị nkwuchiteọnụ n'achụmnta vootu ndị Labour Pati bụ Kenneth Okonkwo ekwuola ihe kpatara o ji hapụ pati All Progressives Congress banye na Labour pati. Na mkparịtụaka Maazi Okonkwo na BBC Igbo mere, ọ kwuru na ebe obi ya niile dị bụ na Naịjirịa. Ọ dọọrọ aka na ntị na pati ọbụla ghọrịrị ya we ghara imezu nkwa o kwere Naịjirịa, na ya ga-ahapụ ha ma katọọ omume ọbụla. O kwuru na ntukwasị obi ya nwere n'ebe Peter Obi nọ bụ maka na nkwa niile o na-ekwe bụ ihe ndị o mebụrụla n'oge ọ na-achị Anambra Steeti nke mere ya ji kwesie ike na ọ ga-emezukwa nkwa niile ọ na-ekwe ndị Naịjiria. Cheta na Kenneth Okonkwo bụ onye a ma ama na-eme ihe onyonyo siri na ime onyonyo wee pụọ, gaa gụọ akwụkwọ maka ịbụ onye ọkaiwu tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ malitere na pati People's Democratic Party mana o siri ebe ahụ pụta banye pati APC n'afọ 2017. N'afọ 2022, ọ hapụkwara pati APC banyezie Labour ebe e mere ya otu onye nkwuchiteọnụ maka achụmnta vootu ndọrọndọrọ ọchịchị nke Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati Labour. https://www.bbc.com/igbo/articles/cy6qyl3750go +sports Commonwealth Games: Ese Brume, Amusan, Chukwuma, Ofili, Nwokocha na ndị ọzọ chakere n'asompi Birmingham 2022 "N'agbanyeghị ka ụbọchị si kwuru na Naijiria, ụmụafọ Naijiria chakere ka kpakpando n'asompi mba ndị nọ n'otu Commonwealth nke afọ a kpọrọ Birmingham 2022. Naijiria ritere ọlaedo 12, n'ime ọla ir35 ha nwetara n'asompi ahụ malitere n'abalị Julai 28 ma kwụsị taa bụ abalị asa8,2022. Lee ụfọdụ n'ime ha: Ese Brume eritere Naijiria ọlaedo nke mere ya ọlaedo nke 12 Naijiria na-erite n'asọmpị Commonwealth Games nke ga-akpụrụ ọnụ taa bụ abalị asatọ nke ọnwa Ọgụst afọ 2022. Mmeri ahụ nke bịara Ụbọchịụka pụrụ iche n'ihi na Brume mere ihe mmnwaanyị emebeghị n'asompi ịkwụ ụgba nke ụmụnwaanyị si mba nọ na otu 'Commonwealth'. Nwaadaa a mụrụ ya n’Ughelli, Delta steeti n’afọ 1996, chawapụtara na Naijiria n’afọ 2012 n’asompi Nigeria Athletics Championship ebeb ọgbara onye nke isii. Brume si n’ezinaụlọ ndị na-eke ike n’asompi dịka nwanne ya nwoke nke obere bụ Godson Okeoghene Brume nọrọ n’afọ 2021 mee n’ime mmadụ emebeghị n’asọmpi ọsọ n’Afrika dịka o meriri n’ọsọ 100 mita nke ndị erubeghị afọ 18. Tobi Amusan bụ onye gbaara Naijiria ụzọ ọlaedo n'asompi 'Commonwealth malitere na Birmingham dị na mba Briten n'abalị 28 nke ọnwa Julai. Amusan ritela ọlaedo n’asọmpi Commonwealth Games dịka o mekwara ọzọ ihe mmadụ emebeghị n’asọmpi 'Commonwealth Games' site na inweta mmeri n’ọsọ mgbochi (hurdle ) 100 mita nke ụmụnwaanyị na tikọmkọm iri na abụọ na ọkara (12.30secs). Favour Ofili so n'ụmụnwaanyị anọ riterela Naijiria ọlaedo n'ọsọ 'relay race'. Ụmụnwaanyị Naijiria anọ a; Rosemary Chukwuma, Tobi Amusan, Favour Ofili, na Grace Nwokocha riteere olaedo n'ọsọ mgbochị 100 mita nke mmadụ anọ! Ụmụada a mere ihe mmadụ e mebeghị n'Afrịka dịka ha nwetara mmeri a na tịkọmtịkọm 42 na ụma (42.10secs). Akụkọ Ofili na-atụ n'anya n'ihi na oge ọ batara mba Briten maka asompi 'Commonwealth Games, a chọpụtara covid-19 n'ahụ ya. Mana ọ gbakere were nwee ike sonye n'asompi ahụ o ritere mmeri. Favour Ofili na-agbara mahadum Louisa University ọsọ. Rosemary Chukwuma bụ ọgbaọsọ Naijiria so mụkee n'asọmpi 2022. Ọ bụghị taa ka Chukwuma malitere ikpokọ ọla n'asompi. N'afọ 2018, Chukwuma ritere ọlaedo n/'ọsọ 100 mịta na""Summer Youth Olympics"" na tịkọmtịkọm 11.17. Folashade Lawal Rafiatu riteere Naijiria ọlaedo n' asompi n'ibu igwe egwuregwu 'Commonwealth Games'. Rafiatu chapụtara n'ibu igwe dara 206KG n'arọ. O mere ihe mmadụ emebeghị n'ibuli igwe dị 59kg 90kg, 116kg na 206kg nke ụmụnwaanyị na-atụghị mpe n'asọmpi ahụ. Ọ sịrị, ""Nne na nna m jibu m eme ọnụ. Nke a ga-eme ka obi kwuo ha ụtọ."" ""Ọlaedo nke 'Commonwealth' a tọọrọ m iche n'ihi na atụghị anya ya. Mana Chukwu mere m ya."" Lawal nwetaburu mmeri n'Afrịka dịka o meriri na asompi 'African Games' nke afọ 2019 nakwa 'African Weightlifting Championships' nke 2021. Nzubechi Grace Nwokocha bụ ọgbaọsọ nnwetarala ọla ugboro ugboro. N'afọ 2021 o riterela mmeri n'ịgba ọsọ 100 mita na Naijiria. Chioma Onyekwere bụ nwada Naịjịrịa ọzọ chawapụtakwara n'asọmpi egwuregwu 'Commonwealth Games' dịka o nwetara Ọlaedo n'asompi ịtụ 'discus'.\n\nỤmụ Naịjirịa chị ọkụ aga asọmpi dị icheiche n'oge a, etu a ha si emepụta Naịjirịa ihu, ndị ndu Naịjirịa a na-emeputakwa ha ihu etu a? Olarinoye A Olanike chapụtara n'ibu igwe dara 206KG n'arọ. Odunayo Adekuoroye ritere Naijiria ọlaedo n'asọmpi igba mgba ụmụnwaanyị n' egwuregwu 'Commonwealth Games nke afọ 2022'. O meriri Anshu Mali nke India were rite nturuugo ahụ na mgba ahụ kara aka. Onye Ondo steeti, Adekuoroye eritebuola ọlaedo n'egwuregwu 'Commonwealth Games' n'afọ 2014,2018 nakwa 2022. Nwachukwu Chiemerie ritere ọlaedo n'asompi ndị ọlụsị na-atụ 'dicus'. Chiemerie tụrụ 'discus na timkom timkọm 34.84 nke mere ya ahụbeghị n'ụwa. Nke mere ka ọ kụchapụ ike ọ kpabuorola dịka o mere n'ọnwa Maachị afọ 2022 na mba Saụt Afrika. Blessing Oborududu ritere ọlaedo n'asompi mgba nke ụmụnwaanyị n'egwuregwu 'Commonwealth Games'. Oborududu meriri Linda Morais na mgba ndị dara 68kg n'arọ. Nwaafọ Bayelsa steeti, enwetala ọtụtụ nturuugo ndị ọzọ nke gụnyere;ọlaedo n'asompi 2022 African Wrestling Championships  nke e mere na mba Morocco n'asompi 'Yasar Dogu Tournament' e mere n'Turkey n'afọ a. Miesinnei Mercy Genesis bụ ọgbamgba ritere Naijiria ọlaedo n'asompi Commonwealth Games' nke e mere bịara n'isi njedebe taa bụ abalị asatọ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2022 na Birmingham, mba Briten. Mercy meriri Madison Parks nke Kanada were nweta ntutuugo ahụ." https://www.bbc.com/igbo/articles/c6p7lj595j2o +entertainment Ọmụgwọ ọ bụ omenala ga-akwụsị n'ala Igbo? Ile ọmụgwọ n'omenala Igbo bụ oge nne na-abịa ileta nwa ya nwaanyị na nwa ọ mụrụ (nke bụ nwa nwa ya). Ụfọdụ oge, ọ bụrụ na nwaanyị enweghịzị nne (ọ bụrụ na nne mụrụ ya anwụọla), nwunye nna ya maọbụ nne di ya ga-abị nọrọ n'ụlọ ya lee ya ọmụgwọ. Ihe mere o ji bụrụ nwaanyị na-ele ọmụgwọ kama nwoke, bụ maka na a na-ewe ya na ọ bụ nwaanyị kacha mara ihe gbasara ya maka na ọ gabigala ọnọdụ ahụ n'onwe ya. Oge ọmụgwọ bụ oge nne na-akụziri nwa ya nwaanyị ihe niile ọ ma maka ilekọta nwa a mụrụ ọhụrụ. Ụfọdụ oge, ọ na-abụ nne mụrụ nwa laa, nne di ya abịa bido lewe ya ọmụgwọ nke ya. Nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-eji ohere ọmụgwọ zuru ike ma nne ya na-elekọta nwa ya. Ọmụgwọ bụ oge nne, nwa ya na nwa nwa ọhụrụ ya na-eji enwe ezigbo mmekọrịta nke bekee kpọrọ 'bonding'. Maka nke a ka ọtụtụ ndị nne na-eji aga ebe ọbụla nwa ha nọ mụọ nwa, ma n'ụlọ maọbụ na mba ofesi, ịga nọkọọ ihe ruru ọnwa atọ maọbụ karịa. Ọ ga-akuzikiri nwa ya nwaanyị ihe ubeakwa nwa ya pụtara, maọbụ akwa agụrụ maọbụ akwa mmekpa ahụ. Nri ekwesịrị iri n'ọmụgwọ Nwaanyị a na-ele ọmụgwọ nwere nri ndị ọ na-eri. Ụfọdụ bụ iji asụchapụ ọbara kpụkọrọ ya n'afọ oge nwa nọ ya n'ime. Nri ndị a bụ ma mkpọrọgwụ ma ngwanri dị icheiche. Ọmụgwọ gwụ, nne bịara ọmụgwọ ga-enweta ihe buru ibu. Ndị ọ bịara ileta ga-azụtara ya ihe onyinye dị icheiche dịka ego, akwa ọmụma, akpụkpọụkwụ, akpa, ihe nri dị icheiche, wee dịrị gawazie. A ga-azụtara ya akpa nnu na akpa ncha nke ọ ga-eke ndị agbataobi ya ma ọ laruo ebe o bi. https://www.bbc.com/igbo/afirika-43369301 +health Coronavirus in Nigeria: Nwaada Igbo ahụ bi n'Amerịka anyị gbara ajụjụọnụ ebughịzikwa coronavirus Nọsụ dị ime bi na New York gwara BBC Igbo na ya bu Coronavirus, ebughịzị ya. Nwaanyị ahụ na-achọghị ka akpọ aha ya kwuru na o mere nyocha ọzọ wee chọpụta na o bughịzi ya. Dịka ụwa niile na-ama jiji maka ọrịa coronavirus, nwaafọ Naịjirịa bụ Chi Onu ekwuola na ọrịa a abụghị ikpe ọnwụ. Chi Onu bụ onye ọrụ ahụike n’obodo New York nke mba Amerịka. Ọ bụ ebe ọ na-eleta ndị ọrịa ka o butere coronavirus. Mana o kwuru na onweghi ihe ọbụla mere ya kemgbe ahụ. O kwuru sị: “Oge a chọpụtara na m nwere coronavirus, akwụsịrị m ọrụ ka m ghara ibufe ya ndị ọzọ.” “O ruola ụbọchị 13 m mechara nnyocha mana onwebeghi ihe ọbụla gosiri na ahụ adịghị m.” “Ma di m na ụmụ m, onweghi onye ahụ na-arịa na-agbanyeghi na mụ na ha na-enwe mmekọrịta etu anyị si emebu.” Chi Onu kwuru na ndị coronavirus na-emesi ike bụ “ndị nwere ọrịa ngụgụ maọbụ ọrịa obi, ndị na-enwe nsogbu iku ume, ndị nwere ọrịa kansa na ndị mmgbochi ọrịa ha (immune system) esichaghị ike.” Ọ dụrụ ọdụ ka ndị mmadụ na-eri mkpụrụosisi na akwụkwọ nri ma zeere mmiri oyi, ‘ice cream’ na ihe ndị jụrụ oyi nke na-enye nje coronavirus ohere ịmụba. O kwukwara sị: “Onye ọbụla atụla egwu, kama kpachapụ anya.” “Ịtụ egwu nwere ike ịkpata mgbochi okuku ume nke ga-eme ka mmadụ chee na ya nwere ọrịa coronavirus.” “Coronavirus dị n’ezie. Ya bụ ọrịa ariala m, riakwaa ọtụtụ ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ, nakwa ọtụtụ ndị m na-eleta dị ka ‘nurse’.” “Ọrịa a egbuola ọtụtụ, mana ọtụtụ agbakeekwaala.” Chi Onu kwuru ka onye ọbụla gee ntị ma rube isi n’iwu gọọmentị. “Nọrọ n’ụlọ, zekwaara mmekọ gị na ndị mmadụ ka ị ghara ibute maọbụ bufee mmadụ ọrịa.” https://www.bbc.com/igbo/afirika-52038420 +health Heat in Nigeria: Etu ị ga-esi gbanahụ ọrịa ndị a okpomọkụ na-ebute Oke okpomọkụ nwereike ibutere gị ọtụtụ ọrịa, ya ka o ji dị mma ka ịmata ọrịa ndị a ma chekwa onwe gị nkeọma. Kamgbe izuụka a ka ụmụ Naịjirịa na-eti mkpu na okpomọku na-eme ha ịwa mana lee ọrịa dị iche iche ya bụ ọnọdụ nwereike ibunye gị. Ọrịa okpomọkụ na-ebute gụnyere ndị a dọkịnta Chidi Akaghara kpọpụtara https://www.bbc.com/igbo/afirika-51612600 +entertainment Children's Day: A malitere m ọrụ DJ mgbe m dị afọ ise - DJ Irish Nwata a dị afọ isii bụ Eze Chikamso e ji DJ Irish maara kọwaara BBC Igbo etu o si malite ọrụ ịkwakọta egwu a na-akpọ Disc Jockey. Ọ sị na ọ malitere inwe mmasị n'ọrụ a mgbe ọ dị afọ ise, mgbe nna ya zụtara udu egwu nwere ihe ndị DJ. DJ Irish sị na ọ gwara nna ya ka ọ zụtara ya ihe DJ ma kpọtara ya onye nkuzi ga-enyere ya aka. Nna ya mere nke a ma nyekwa ya nkwado ịmalite nkwọkọta egwu. Nne Irish bụ Adaobi Eze sị na ọrụ ya dịka DJ anaghị emetụta agụmaakwụkwọ ya, na ọ bụ ya mere o ji akwado ya. Kirie ihe ha kwuru n'uju; Ndị mere akụkọ a: Ikechukwu Kalu na Nnamdi Agbanelo https://www.bbc.com/igbo/afirika-57252263 +religion Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị Bishọp Katọlik ehiwela ngagharịiwe Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a Ndị Bishọp ụka Katọlik ehiwela ngagharịiwe Ndị Bishọp ụka katọlịk na Naịjirịa ehiwela ngagharị iwe n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee maka ndị ụka ha gụnyere ndị ọzụzụ atụrụ abụọ egwuru na Benue Steeti n'ọnwa gara aga Ngagharị iwe a ga-eme n'ụbọchị ahụ aga-eli ndị a nwụrụ anwụ ma kpọkuo ndị ụka Kraịst niile ga ha gbakọta aka ọnụ mee ya bụ ngagharị iwe. Gọvanọ Rochas Okorocha na ndị ndu APC na-alụ ọgụ Ọgbaghara ka na-aga n'ihu na pati APC nke Imo Steeti dịka Gọvanọ Rochas Okorocha ebola ndị ndụ APC bụ National Working Committee ebubo na aka ha dị na ya. Na nzaghachi, onye odeeakwụkwọ APC bụ Bolaji Abdullahi gwara Gọvanọ Okorocha na ọ bụ enweghi ike ịhazi mmekọrịta dị n'etiti ya na ndị nke ya bu nsogbu ya, ya ebokwasila ndị ndu APC ihe o wetara onwe ya World Health Organisation (WHO) Otu na-ahụ maka ahụike n'ụwa bụ World health Organisation ekwuola na ha na-atụ anya ibubata ọgwụ nyọcha maka ọgwụgwụ ọrịa ebola na mba Congo na mbido izuụka a. Ha kwuru na ruru ọnụ ọgwụ puku anọ bụ ihe a ga-eziga n'ebe ahụ. Barcelona amala afọ n'ala na ebumnobi ha ịbụ ndị anaghị emeri emeri n'asọmpị La liga nke afọ a. Ebe Neymar turula ugo dịka ọkacha agba bọọlụ na France Lig Une Rangers na Akwa United enwetaghị goolu ọbụla dịka ha zutere onwe ha n'asọmpi NPFL nke izuụka Iri abụọ na otu. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji https://www.bbc.com/igbo/afirika-44106501 +entertainment Big Brother Naija 2020: Lee ihe ị kwesịrị ịma maka mmadụ 20 nọ n'ime ụlọ a Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ndị Igbo karịrị dịka a malitere Big Brother Naija Season 5 n'ụbọchị 19 nke ọnwa Julaị. https://www.bbc.com/igbo/afirika-53468807 +politics Nigerian Constitution: Adịmiche dị n'etiti iwu Naịjirịa nke ndị agha na ndị ọchịchị onyekwuouche ya dere “Iwu a jikọrọ Naịjirịa bụ iwu ndị agha manyere anyị amanye mgbe ha naara ọchịchị na afọ 1966. Anyị agaghị enwe udo, ruo mgbe a weghachịrị iwu jikọrọ obodo a ka ọ bụrụ mgbe mmadụ niile si obodo a jikọrọ aka wepụta ya bụ mgbe Naịjirịa were nnwereonwe ha”. Okwu a Ayo Adebanjo kpụ n’ọnụ bụ okwu ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa kpụ n’ọnụ ugbua. Ụfọdụ na-ekwu na iwu obodo Naịjirịa bụ iwu na-emegide ndị mmadụ nkịtị na Naịjirịa. Ụfọdụ ndị ọzọ na-eti mkpu ka e weghachite iwu jikọrọ obodo nke afọ 1963 bụ iwu mbụ nke ndị Naịjirịa niile na mpaghara niile jikọrọ aka wee wepụta ka ọ bụrụ iwu ga-achịkọta ha, ma tufuo iwu afọ 1999 nke ọchịagha Abdulsalami Abubakar hibere ka ọ chịkọta obodo Naịjirịa. Ka a kwụsịtụ ntuliaka 2023 ma tinye onyeisiala ga-anọ ọnwa isii ka ọ nwee kwadoo iwu ọh��rụ obodo Naịjrịa nke ọ kpọrọ ‘a new-look peoples constitution’ Afe Babalola (SAN) tinyekwara ọnụ n’okwu a. Mana kedụ ndịiche dị n’etiti iwu abụọ na-akpalite ọtụtụ okwu n’obodo Naịjirịa? Iwụ jikọrọ Naịjirịa agbanweela ọtụtụ oge site na mgbe ndịọcha na-achị, ruo mgbe naị Naịjirịa nwetere nnwereonwe ha, ruo mgbe ndị agha weere ọchịchị ma ruzie ugbua Naịjirịa bụzị obodo ọchịchị onye kwo uche ya. Ka anyị malite n’afọ 1914 mgbe lord Federick Lugard hibere iwu nke mbụ nke Naịjirịa. E mechara chọpụta na iwu ahụ nwere ọtụtụ nsogbu dị na ya. Okwu a kachasị kpụrụ n’ọnụ iwu jikọrọ obodo Naịjirịa nke 1999 bụ nnabata atụmatụ ‘Federal Character’. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ usoro gọọmenti etiti hibere iji megide maọbụ gbochie ọganihu ụfọdụ mpaghara dị na ndịda naịjirịa. Mana kedụ ihe bụ ‘Federal character’, kedụ ihe iwu Naịjirịa kwụrụ maka ya? Iwu a kwuru na nchịkọta na usoro a ga-esi hibe gọọmenti maọbụ ngalaba gọọmeti ọbụla ga-abụ usoro ga-egosipụta ma wulie ịdịkọ n’otu. Nke pụtara na ọ gaghị abụ n’otu steeti maọbụ otu mpaghara ka ndị niile nọ na ngalaba ahụ ga-esi. Ọkaiwu Goddy Uwazurike gwara BBC na okwu ‘Federal Character’ a na-ewute ya dịka onye Igbo. Ọ sị na mgbe e chepụtara echiche, na ọ bụ ezigbo ihe ọma. Uwazurike sị na etu e si eme ya na mbụ bụ ndị mpaghara ọbụla wepụta mmadụ ole dị etu a. Mana ọ dịghịzi etu a ugbua. Ọ gara n’ihu kwu na nwa ya chọrọ ịga ụlọakwụkwọ ugbua, ọ sọ ya bụrụ onye nke mbụ n’akwụkwọ, o nwereike onye ikpeazụ agawa n’ihu yanwa gbara nke mbụ. Ọ sị na ọ bụzi mmegbu ka e ji ya eme. 2.  Mgbakwunye n’ikike ọchịchị etiti bụ ‘Exclusive legislative list’ Atụmatụ ọzọ na-ebute ndọrọndọrọ bụ nke gbasara ‘Exclusive legislative list’ nke e bugoro site na 45 ruo 68 ma bugokwuo ‘Concurrent Legislative List’ site na 29 ruo 30. Ọkaiwu Chukwuemeka Eze gwara BBC na e weere ụfọdụ ikike dị iche iche steeti nweburu nyefee ya n’aka ndị ọchịchị etiti. O kwuru na n’ime 30 ahụ dị n’aka ndị steeti, na ọchịchị etiti nwekwara ike itinye aka na ya. Nke a mere ka ndị mmadụ na-ebe akwa na-asị ọ bụ na onye nọrọ na steeti ọbụla ọ nọ, ọ chọọ ihe ọbụla, ọ gawa Abụja, nke a mere ka ọ dị ka ndị steeti a na-agba odibo. (3:05 mins) 3.      Etu e si eke ego akụ ọnatarachi obodo na steeti niile. Ọkaiwu Chukwuemeka Eze kọwara na n’afọ 1963,  ihe akụ ọnatarachi nọ n’aka ndị mpaghara buru ibu. Na ọ bụ ha rụpụta, nwete ego, ha enyetụ ndị gọọmenti etiti, jidezie nke fọrọ. Mana ugbua, ihe niile e ji emepụtazi ego nọzi n’aka gọọmenti etiti. Nke a mere ka ndị gọọmenti steeti jizi arịọzi oke arịrịọ n’aka gọọmenti etiti maka obere nsogbu ọbụla ha nwere. Ọ bụ ya mere ụfọdụ ji eti mba, ihe aghasaala, na ọ bụghị etu e si kpaa ya na mbụ. Ụfọdụ na-ekwuzi ka a laghachi azụ na iwu afọ 1963. 4.      Iwu gbasara onye nwe ala nke bụ ‘Land use act’. E hibere iwu ‘Land use act’ nke Naịjirịa n’afọ 1978 mana e tinyere ya n’iwu Naịjirịa nke afọ 1979 ma bufekwaa ya na iwu 1999 iwu. Iwu a kwuru na ala niile dị na steeti ọbụla ma e wepụ nke gọọmenti etiti maọbụ ụlọọrụ gọọmenti etiti nwe, bụzi gọọmenti steeti ahụ nwe ya. Ụfọdụ ihe ndị ọzọ gbanwere n’iwu jikọrọ Naịjirịa nke 1963 ma a tụnyere ya nke 1999 gụnyere; ịgbado ụkwụ na afọ ole gọọmenti etiti maọbụ nke steeti nwereike ịnọ n’ọchịchị ka ọ bụrụzie afọ anọ, e mere nke a n’iwu afọ 1979. Nke ọzọ bụkwa na e nwereike ichutu onyeisiala n’ọkwa ya ma ọ bụrụ na a chọpụta na o tozughi ị were oche ya, e kewara ụlọ omeiwu ka ọ bụrụzie ụlọomeiwu ukwu na ụlọ omeiwu nta, na ihe ndị ọzọ. Mana ruo taa, ọtụtụ ndị mmadụ ka na-akpọ oku ka e yigharịa iwu a jikọrọ obodo Naịjirịa weghachi ya n’iwu nke 1963. Oku a adịghị ka ọ ga-akwụsị na nsonso a mana Ọkaiwu Chukwuemeka Eze gwara anyị na; “Aka ndị agha ji hibere iwu obodo a bụ ka ihe niile na-aga n’ọchịchị etiti. Naịjirịa na-aza ‘Federal’ n’ọnụ mana etu ha si eme ihe bụ Unitary nke bụ na ikike si otu ebe abịa, ndị nke ọzọ a na-agba odibo. E kwesịrị ịwepụ ụfọdụ ikike dị n’aka gọọmenti (Exclusive legislative list), tinye ya n’ikike ndị steeti (Concurrent Legislative List), ọ ga-adịkwa mma ma e mee ya etu ahụ”. https://www.bbc.com/igbo/articles/c84xw2eln0lo +health Exercise for pregnant women: Ị dị ime? Zeere mmegharị ahụ ndị a. Oge nwaanyị dị ime bụ oge dị oke mkpa. Dịka ụfodụ ihe onyonyo n'ịntanetị na-egosi ebe ụmu nwaanyị di ime na-eme ihe mmegharị ahụ dị iche iche. Ndị okaibe maka ịdị ime etinyela ọnụ ma nye ụmụ nwaanyị ndụmọdụ maka mmegharị ahụ ziri ezi oge ha dị ime. https://www.bbc.com/igbo/afirika-56791907 +sports Emmanuel Okala: E tu m siri si n'ịgba bọọlụ ogbe gbawara Rangers nakwa mba ụwa bọọlụ """Obim ka dịkwa n'otu bọọlụ Rangers nakwa Super Eagles agbanyeghị na anaghị emeta ha ọfụma"" Nke a bụ okwu si n'ọnụ Emmanuel Okala onye bụ ochee bọọlụ ya na ndị otu ya mabutere iko ""Nation's cup"" mbụ Naịjiria ritere n'afọ 1980. O kwuru na agbanyeghị na ndị na-agba bọọlụ ugbua na-efegazi mba ofesi, o chere na gọọmenti Naịjirịa meta ha mma site n'ịkwụ ha ezigbo ụgwọ ma jiri ndị ọgba bọọlụ ugbua kpọrọ ihe, ha ga-alaghachite ma jiri obi ha niile gbaara Naịjirịa bọọlụ. Ndị mere akụkọ a bụ Chukwudi Okereke na Vining Ogu." https://www.bbc.com/igbo/57577840 +health Coronavirus Update: Ihe mere m ji agụrụ ndị m na-agwọ covid 19 egwu- Dọkịta Igwe A na-ahụ ndị dọkịta ka ndị ọrụ ha bụkarịrị inye ọgwụ, gwọọ ọrịa dgz. Mana dọkịta Michael Igwe bụ dịbia bekee agbanwetụla nke a site n'ijikwu ma egwu wee nyere ndị ọ na-agwọ ọrịa covid- 19 aka ikpalite mmụọ ha. https://www.bbc.com/igbo/media-52658479 +health Cancer, diabetes na ọrịa ndị ọzọ e jibu mara ndị okenye ndị ntorobịa na-arịazị ugbua "Ihe dịka afọ iri gara aga, e nwere ụfọdụ ọrịa a na-eche na ọ bụ sọsọ ndị okenye ka ụfọdụ ọrịa ndị a na-arịa. Mana ugbua, ọrịa ndị a gụnyere ọrịa shuga na ọbara mgbali elu, so n'ọrịa na-egbu ndị ntoroọbịa ugbua. Ngalaba World Health Organization (WHO) bụ ngalaba na-ahụ maka ahụike na mbaụwa, kwuru na ọrịa ndị a na-arịazị ndị ntoroọbịa ugbua, na-ebute ọnwụ mmadụ abụọ n'ime mmadụ atọ n'ụwa niile. BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị dọkịta ajụjụ ọnụ maka ihe ngalaba ahụike WHO kwuru. Ihe ha kwuru bụ ihe mmadụ niile kwesịrị ige ntị nụrụ. Ihe ndị dọkịta kwuru: Otu n'ime ha bụ Dkt. Zubair Abdullahi bụ onye kwuru na ụfọdụ ọrịa ndị a na-adị n'agbụrụ, nke pụtara na ọ ga-emetụta ndị ahụ ma ha abụ okenye maọbụ ntoroọbịa. Onye nke ọzọ bụ Dkt. Henry Eze, kwuru na o nwereike ịbụ na ọgwụgwọ Bekee akawanyela mma, nke pụtara na a na-achọpụta ọrịa ndị a n'oge mgbe mmadụ ka bụ ntoroọbịa. Mana dọkịta abụọ a kwekọrịtara na oke ibu, iri nri ọjọọ nakwa emegharịghị ahụ, socha n'ihe na-eme ka ndị mmadụ bute ọrịa ndị a. Ha kwuru na ọ bụrụ na ị chọpụta otu n'ime ọrịa ndị a dị n'agbụrụ gị, ị gaghị agbanwenwu ya. ""Ọ bụghị ihe niile ka ị ga-agbanwenwu, mana ibi ndụ ọfụma ga-enyere gị aka dọtịa oge ọrịa ahụ ga-eji chukwute gị"". Ihe nkiri a maka nwaanyị meriri ọrịa kansa ga-amasị gị: Akụkọ ndị a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51251698 +sports NBA Draft 2020: Lee Ụmụafo Naịjirịa ahọpụtara isonye tụọ bọọlụ nkata NBA n'afọ a Jordan Nwora, Isaac Okoro na ndị ọzọ esonyela na otu dị ukwu na bọọlụ nkata na mba Amerịka. https://www.bbc.com/igbo/afirika-54998889 +entertainment Ọ dị mma nwaanyị ịrịọ nwoke ọ hụrụ n'anya maka ọlụlụ? Ọtụtụ mgbe ka ọ na-abụ nwoke bịa ịrịọ nwaanyị maka ọlụlụ nke Bekee kpọrọ 'Engagement', o gbusa ikpere n'ala rịọ nwaanyị ahụ. Nke a ebutela oke arụmụka n'etiti ụmụ afọ Igbo, dịka a na-ajụ ma ọ bụ omenala Igbo ka ọ na ọ bụghị. Mana nwaanyị sekpuru ala rịọ nwoke ka ọ lụọ ya, i chere na ọ bụ ihe ziri ezi? Ngwa kirie ihe ụfọdụ ndị mmadụ gwara BBC Igbo maka nke a; Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/53683899 +business Personal Finance: Ebe asaa i nwereike itinye ego ị tụkọtara Ichekwa ego na kom-kom, okpuru akwa maọbụ n'ụlọakụ maka echi dị mma, mana itinye ego n'ebe ọ ga-amụtara gị ihe kacha mma. Ihe nke a jị dị mkpa bụ maka na mbuli ọnụahịa (inflation) na-eme ka uru ego gị gbadaa ma ọ bụrụ n'ị hapụ itinye ya n'ọrụ nke na ihe ọ zụtanwuru n'afọ a, ọ gaghị azụtanwu ya n'afọ ọzọ. Ọmụmaatụ: N'afọ 2015, otu akpa osikapa na-ada puku naira 12 mana n'afọ 2019, onye dowere puku naira iri abụọ na kom-kom n'afọ 2015 agaghị eji ya zulie otu akpa osikapa dịka ọnụahịa ya kwụzị naira puku 17. Dịka NBS siri kwụọ, mbuli ọnụahịa dị pasent 9.02 n'afọ 2015 mana ọ gbaliri rue pasent 11.08 n'afọ 2019. Na nkọwa ya, onye ọkachamara n'ihe gbasara nhazi ego onye bụ Uche Iheanacho rụtụrụ aka n'ebe asaa mmadụ nwereike itinye ego o chekwatara ka ọ mịtara ya ezi mkpụrụ. 1. Iji ego achụ ego maọbụ ịgbakwụnye ihe ọzọna abụghị isi ọrụ gị na-ewetara gị ego Ị na-arụ ọrụ Bekee ma ị na-azụ ahịa, i nwereike izipụ ego gị ka ọ na-agara gị ozi ịchụ nta ego. Ihe dịka itinye ego n'ịgba 'Keke', ụgbọala maọbụ ọkada, ire ahịa maọbụ ịtụbata ahịa so na ihe i nwereike ime ego i dokwara ana-agbalite. Nke a bụ akwụkwọ ego gọọmenti na-azụ n'aka ọha ọnwa issi maọbụ otu afọ iji nweta ego ha ji arụ ọrụ. Nke dịkwa ka 'treasury bill' mana ọ na-ewe ọtụtụ afọ bido afọ abụọ maọbụ iri abụọ. 4. 'Fixed deposit' Nke a bụ itinye ego gị n'ụlọakụ ọnwa atọ, isii maọbụ otu afọ maọbụ oge ole gị na ụlọakụ kwekọrịtara, na akpaghị ya aka maọlị. Uru dị ya bụ na ọ ga-amụtara gị nwa karịa ego ichekwara n'ụlọakụ nke ị na-adobiri oge ọbụla ọ masịị gị. 5. Itinye ego n'ego mba ndị ọzọ(Forex) Itinye ego n'ego igwe dịka paụnds maọbụ dọla ga-echekwa ego gị ọ gaghị ada rue ka ego gị ma ọ bụrụ na ị hapụrụ ya n'ụlọ maọbụ n'ụlọakụ. Igba ala bụ ezigbo ebe i weere ike iji gị a bara gị ezigbo uru. Ịgakwu akwụkwọ maọbụ ọmụmụ ga-enye gị ohere ịmụta nka maọbụ iwelite amamihe n'ihe nke ị ma na-eme maọbụ ọrụ ị na-arụ ga-eme ka ị na-enweta karịa ihe ị na-enwetabu na mbụ. Gee ya n'ụju n'ihe onyonyo dị n'elu: Davido egechiela Chioma! Foto ndị si na mkwanye ugwu ikpeazụ Robert Mugabe https://www.bbc.com/igbo/afirika-49676984 +business Urazi Palm Oil: Ihe mere mmanụ a ji bụrụ ọpụrụiche na mmanụ nri ndị ọzọ Mmanụ Urazi bụ mmanụ pụrụiche e si n'osisi nkwụ emepụta na mpaghara Ebonyi Steeti. Etu e si emepụta ya dị iche n'etu e si emepụta mmanụ nri ndị ọzọ. N'ihe onyonyo, a kọwaara usoro e ji emepụta ya nakwa uru ọ baara. Ndị mere akụkọ a bụ Chukwudi Chris Santus Okereke na Chiemela Mgbeahuru https://www.bbc.com/igbo/afirika-58612060 +entertainment Nkechi Blessing Sunday: 'Otele ukwu m na-ekopu ụwa' Nkechi Blessing Sunday bụ onye Igbo ime ejije ndị Yoruba na-amasị. Ọ gwara BBC Igbo na ọ bụghị nnukwu otele ya na-enye ya ọrụ, kama ọ bụ makana ọ na-emete ihe ọbụla a sị ya mee dịka onye na-eme ejije. O kwukwara na anaghị agba ya ndina tupu o soro mee ejije. Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/media-45911056 +sports Liverpool vs Atletico Madrid: Atletico efopụla Liverpool ka ahịhịa na Champions League Nke a bụ agba nke abụọ n'asọmpi dị n'etiti Liverpool na Atletico Madrid maka onye ga-etozu ịga n'ihu maka asọmpi Champions League. Ndị Liverpool bu n'obi ịbọgwara mmeri Atletico ji otu ọkpụ goolu merie ha na Madrid n'asọmpi nke mbụ ha. Ọ dị ka nzube ndị Liverpool a ga-emezu dịka Georginio Wijnaldum nyere goolu nke mbụ na nkeji iri anọ na atọ. Liverpool rụrụ ụlọ were biri na'ogige ọnụ postu ndị Atletico n'agba nke abụọ n'asọmpi a. Ndọlị ndọlị ha mịtara mkpụrụ dịka Roberto Firmino ji isi ya kara aka were takaa neetị ndị Atletico na nkeji iri itoolu na anọ. Ndị Liverpool agaghị echefu etu onye na-eche ọnụ poostu ha siri gbanye ndị Atletico bọọlụ n'ụkwụ nke mere ka ha were ohere a nye goolu mbụ ha n'aka Marcos Llorente. Nke a gbara ndị Atletico ume dịka Llorente gara n'ihu nye goolu ọzọ na nkeji otu narị na ise. Ọ bụ Alvaro Morata ji goolu nke atọ techuo Liverpool ihu mgbe ọ fọrọ ọkara ole na ole ka e gbuchie asọmpi a . https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51848010 +religion Is Osinachi Husband a pastor: Dị Osinachi Nwachukwu ọ bụ ụkọchukwu? "Ndị mmadụ na-ajụ onye bụ Peter Nwachukwu kamgbe ọnwụ nwunye ya wuwara na soshial midịa bụ Osinachi Nwachukwu, onye oti egwu a ma ama. Kamgbe Epreelu 9, 2022 ka aha Peter ji ewu dịka akụkọ ọnwụ nwunye ya bụ Osinachi Nwachukwu pụtachara n'elu soshal midia. Kama nne Osinachi Nwachukwu zara ajụjụ ụfọdụ na-ajụ ma di nwa ya ọ bụ 'Pastor'? Ọ zara sị na ọ bụ 'Pastor' na nghọta nke ya. Ọtụtụ ndị ma di na nwunye a tụmadị ọgụ egwu Frank Edwards ama ama pụtakwara na-ekwupụta na ọ bụ aka ike Peter Nwachukwu ji eso nwunye ya butere ọnwụ nwunye ya. Ka ọ dị ugbua ndị uweojii Naịjirịa anwụchiela Peter Nwachukwu onye nke ha si na ha na-enyocha maka ebubo mmekpa ahụ ọ na-emekpa nwunye ya, ọtụtụ mmadụ gụnyere ezinụlọ Osinachi boro ya tupu nwunye ya anwụọ. Aha nwada Osinachi Nwachukwu onye gụrụ 'Ekwueme' na-akpọtụ ebe nile na soshal midia kemgbe ụbọchị Satọde 9 Eprel, 2022 mgbe akụkọ pụtara na ọ nwụọla. Hyacinth Ogbu bụ onye nchịkọta egwu otu 'Glorious singers' bụ ebe Osinachi na ejima ya bụ Amarachi Eze malitere iti egwu gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu. Ogbu sị na ọ bụ ihe mwute nye ndị otu ha nakwa ezinaụlọ Nwachukwu na Madu maka akụkọ banyere ọnwụ Osinachi. Nwachukwu, onye gụrụ egwu ọtụtụ ndị ụka kraịst ma bụ ""Ekwueme"" bụ onye egwu ya na-amasị ma na-akpalite mmụọ ndị mmadụ n'ụzọ dị iche iche. Ndị mmadụ na-agba akaebe etu egwu ya si eme ka ha na-echee echiche maka ndụ ha na mmekọrịta ha na Chukwu kere ha. Ndị maara Nwachukwu kọwara ya ka dịka ezigbo mmadụ nakwa onye ihe gbasara Chineke na-anọ ọkụ n'obi. Tupu ndị uweojii anwuchie Peter Nwachukwu bụ di Osinachi BBC Igbo gbara mbọ ịnụta olu di ya site n'izigara ya ozi ma kpọọkwa ya. O gosiri na ọ gụrụ ozi ndị ahụ mana ọ zachịghaghị." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61085970 +entertainment Cubana Chief Priest vs Maria BBNaija: Etu ebubo o boro Maria si akụkọta isi ọtụtụ mmadụ Ebubo a Cubana Chiefpriest boro Maria nke ọ sị na ọ na-ayị di nwanne ya nwaanyị apụọla n'egwu dịka ọ kụkọtala isi ụtụtụ mmadụ ọnụ. Site n'ihe Chiefpriest dere n'Instagram, ọ kpọrọ aha otu onye a na-akpọ Paul Okoye e ji 'Paulo' maara ma sị na ọ bụ ya mere Maria ji mata onye Paulo bụ. Na nzaghachị Paul gwara Chiefpriest ka ọ na-ekwu ihe doro ya anya tupu ọ na-ebo mmadụ ebubo. Nke a were Chiefpriest iwe mere o jiri bipụta akwụkwọ alụkwaghịm nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ gụnyere akara ekwentị Maria. Paulo gara n'ihu bipụtakwa akara ekwentị Chiefpriest n'Instagram ma sị ka ndị mmadụ kpọọ ya n'ekwentị. Achọghị m itinye ọnụ n'ebubo Cubana Chief Priest na-ebo m - Maria BBNaija Nwada a ma ama so bụ n'emume Big Brother Naija bụ Maria Nkechinyere Chike ekwuola na ọ chọghị itinye ọnụ n'ebubo Cubana Chief Priest na-ebo ya. Maria kwuru nke a mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ndị nnọchite anya ya ka o zara ọnụ n'ebubo sị na ọ na-apụrụ otu nwaanyị di ya ma na-eyi nwaanyị ahụ egwu n'elu ya. Pascal Okechukwu bụ onye e ji Cubana Chief Priest maara depụtara n'Instagram ya Maria nwere obi siri ike maka etu o si na-apụ nwanne ya nwaanyị di ya ma gaa n'ihu sị na ọ ga-egbu ya. Ọ sị na ọ gaghị ekwe ka okwu ahụ laa n'ụkpọrọ na ọ ga-achọrọ Maria na di nwanne ya nwaanyị a kpọrọ Kelvin gaa na Dubai. Okwu a mere ka ọtụtụ malite ịkatọ Maria ebe ọ dị ukwuu, ebe ụfọdụ ndị sị ka ChiefPriest gosi ihe akaebe tupu ọ na-ebo mmadụ ebubo. ChiefPriest gara n'ihu gosi akwụkwọ alụkwaghịm nwanne ya nwaanyị gbara n'ụlọikpe dị n'Aba n'ọnwa Sepụtemba. O gosikwara nzirita ozi n'ekwentị nke mere n'etiti Maria na nwanne ya nwaanyịma sị na Maria nwere obi na-enye ya ndụmọdụ na-agbanyeghi ihe niile o mere ya. Mana ihe ndị a e dere n'ozi ahụ bụ ebe Maria na-arịọ nwaanyị ahụ ka ya na di ya kpee udo n'alụmdinanwunye ha. Tupu akụkọ a na-apụta BBC Igbo kpọtụrụ Cubana ChiefPriest ka ọ kọwaa ebubo ndị a mana ọ zabeghi oku anyị kpọrọ ya. Kedụ ihe ezinaụlọ Kelvin Kwuru? Nwanne nwoke Kelvin onye a sị ya na Maria na-ayị pụtara n'Instagram ma zaa Chiefpriest okwu maka ebubo ọ na-ebo Maria na nwanne ya nwoke. Nwamadị a sị na nwanne ya Kelvin na nwunye agbasaala tupu ọ malite ịyị Maria. Ọ sị na ihe butere nsogbu n'ezinaụlọ ha bụ na nwunye Kelvin na-akatọ ma na-emechu ya ihe nke ukwuu nke mere Kelvin ji sị na ike agwụla ya. Ọ gaara n'ihu kwuo na nwunye Kelvin chụpụrụ ha niile (ma nne Kelvin) n'ụlọ nwanne ya nwoke rụrụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-59031765 +entertainment Kim Kardashian: Gịnị bụ ọrịa 'lupus' na-arịa ya? "Kim Kardashian, nwanyị a ma ama na mba Amerịka, kwuputara na ya na-arịa ọrịa a na-akpọ ""lupus"". O kwuru na ya gbalịrị ihe nille o nwere ike iji ụzọ dị ka chi si kee ya wee gwọọ ya bụ ọrịa mana onwebeghi isi. Ugbua, otu dibia bekee bụ ọkaibe aha ya bụ Dkt Wallace, na-enyezi Kardashian ọgwụ maka ya bụ ọrịa. Kardashian kwuru na ụjọ tụrụ ya mgbe a gwara ya na o nwere ọrịa ahụ. O kwuru na ọbụ mgbe e mere ya nnyocha ahụ n'ọnwa Mee ka a chọpụtara ọrịa a. Anyammiri juru Kardashian anya oge ọ na-akọpụta ihe ndị a na ngwụcha izuuka gara aga. ""Lupus"" so n'ọrịa nke bekee kpọrọ ""autoimmune diseases"". Dịka Chioma Ofoekii onye bụ dibia bekee si kọwwara BBC Igbo, e nwere ihe ndị dị n'ime ahụ mmadụ nke na-enye aka iji gbochie ọrịa. Mana mgbe ụfọdụ, ihe ndị ahụ na-egbochi ọrịa nwekwara ike tụgharịa buso ahụ mmadụ agha. ""Ọbụ mgbe ihe dị otu a mere ka a na-ekwu na mmadụ nwere 'autoimmune disease'"". Ofoekii kwuru na ọbụ ụmụnwanyị na-enwekarị ụdị ọrịa ndịa. Mana ọpụtaghị na nwoke anaghị enwe ya. Ọmụmaatụ ụfọdụ ọrịa ndị a gụnyere, ọrịa agba ikpere tụmadi nke a kpọrọ (Rheumatoid arthritis), dayabitis nke mbụ (Type 1 diabetes), dgz. Kedu ka ọrịa ""Lupus"" si eme mmadụ? Ọrịa ""Lupus"" na-emetụ akụkụ ahụ dị icheiche. Ọ na egburi njikọ ọkpụkpụ, na emetụta akpụkpọ ahụ, kidini, ọbara, ụbụrụ isi, obi nakwa ngụgụ. Onye na-arịa ọrịa ""Lupus"" nwere ike ị na-enwe oke ike ọgwụgwụ, mgbu na njikọ ọkpụkpụ, ihe ịghakasị n'ahụ, oke ahụ ọkụ, dgz. Dịka nwaada Ofoekii sị kwuo, ọrịa niile a kpọrọ 'autoimmune' anaghị enwe ọgwụgwọ. Otu aka ahụ, e nwebeghị ụzọ ọbụla a ma e nwere ike iji gwọọ ọrịa ""Lupus"" ka ọ laa kpam kpam. Mana ndị ọkacha mara kwuru na ihe ka mma bụ ịchọ ụzọ a ga-esi ebelata ụmụ ọrịa ndị ọzọ ahụ ""lupus"" na-akpata, dịka ahụ mgbu, ihe ịghakasị n'ahụ, nakwa oke ahụ ọkụ. Nwaada Ofoekii kwuru na mgbochi ọrịa ka ọgwụgwọ ya mma. Ọ dọrọ aka na ntị ka mmadụ gaa ụlọọgwụ mgbe ọbula ọ dara ọrịa. Ofoekii kwuru sị: ""Ọ dịghị mma mmadụ ịnọ n'ụlọ were aka ya na-enye onwe ya ọgwụ."" ""Maka na onye ahụ agaghị ama ihe na-arịa ya."" ""Onye rịawa ahụ, ya gaa n'ụlọọgwụ n'oge ma mee nyocha zuru oke tupu ọrịa ahụ akawanye njọ"". Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49660425 +religion Abụbu m ụkọchukwu n'ụka 'deeper life' tupu m banye okpukperechi Islam - Murtala Chukwuemeka Murtala Mohammed Chukwuemeka Amaeze bụ onye Orlu n'Imo Steeti mana ọ bụ onye okpukperechi Alakụba, ma bụrụkwa onye tụgharịrị akwụkwọ nsọ ndị ha bụ Kọran n'asụsụ Igbo. Amaeze sị na ya bụbu onye ụkọchukwu ụka 'Deeper Life' kama ọ hapụrụ ya were soro okpukperechi alakụba n'afọ 1989. O so na ndị nchịkọta ụka 'Deeper Life' na mpaghara Ajegunle site n'afọ 1986 ruo 1988. Amaeze gara n'ihu kọwaa na alakụba batara ala Igbo kamgbe afọ 1745. Ọ kọwara na e nwere Koran n'asụsụ Awụsa na Yoroba kama enweghị ya n'asụsụ Igbo. Ọ kwuru na ihe ọ mere kwesịrị inye ndị Igbo ọṅụ. Amaeze gwara BBC Igbo na o were ya afọ ise ịtụgharị Koran n'asụsụ Igbo. Onyeis ụlọ ofufe ebe Amaeze na-efe ofufe bụ Akinyemi Ibira kwuru na obi dị ya ụtọ na ọ bụ onye ụka ya tụgharịrị Koran n'asụsụ Igbo. Amaeze kwuru na anaghị amanye mmadụ ịbụ onye alakụba kama na ọ bụ mkpebi nke onwe. O kwukwara na ọ bụghị n'ihi ego mere ya ji tụgharịa Koran n'asụsụ Igbo, kama ọ bụ iji wulite okwukwe ndị Igbo ndị ọzọ bụ ndị okpukperechi alakụba. https://www.bbc.com/igbo/articles/cllzzqn22y6o +politics Chukwuma Soludo: Onyeka Onwenu, Charly Boy ekwuola etu ha ga-esi weta udo n'Anambra site na kọmịtịị udo ahọpụtara ha "Gọvanọ Chukwuma Soludo hibere kọmịtịị ọhụrụ maka nhazị udo, eziokwu na ikpe ziri ezi n'Anambra steeti n'ụbọchị Tuzde bụ ụbọchị atọ n'ọnwa Eprel, 2022. Ụfọdụ n'ime ndị nọ na kọmịtịị bụ Onyeka Onwenu na Charles Oputa (Charly Boy) kọwara BBC Igbo etu obi dị ha maka nhọpụta nakwa olileanya ha nwere maka mpụtara ọrụ kọmịtịị a ga-arụ na steeti ahụ. Ọkpụrụkpụ ihe ole m ole Onyeka Onwenu kwuru banyere nhọpụta ya O kwuru na nhọpụta a tụrụ ya n'anya ma nye ya obi ụto agbanyeghị na ọ bụghị onye Anambra steeti, ma kwuo na ọ nabatara ya bụ nhọpụta. O kwuru na nhọpụta a ga-enye ohere itinye aka n'ịdajụ oke ọgbụgbu ndị mmadụ n'ala Igbo na-agbawa ya obi nke ukwuu. Nwaada Onwenu kọwara na ọgbaghara dị n'ala Igbo bụ ihe na-eche ya oke echeche ọkachasị dịka o ji anya ya hụ agha Biafra nke o kwuru na ọ dere n'akwụkwọ ya. O kwuru na ọ ma na kọmịtịị a ga-amịta mkpụrụ n'ihi na ndị a họpụtara bụ ndị ọkaibe n'ọrụ ihe gbasara ọchịchị nakwa ikpe udo. Ọ kọwara na etu ụzọ mkparịtaụka si bụrụ otu gbara ọkpụrụkpụ a ga-eweghachịte udo n'Anambra steeti nakwa n'ala Igbo niile. O toro gọvanọ Chukwuma Soludo ma kwuo na ihibe kọmịtịị a gosiri na ọ dị njikere n'ọrụ ọchịchị nke kachasị iweghachịte udo n'Anambra steeti nakwa ala Igbo. Nwaada Onwenu gara n'ihu kwuo ""Ama m na ọrụ iweghachịte udo a agaghị a dị mfe, mana e nwere m olileanya na mpụtara ya ga-akwara akụkụ Naịjirịa ndị ọzo ụzọ n'okwu udo"". Ihe ị kwesịrị ima maka Onyeka Onwenu Okpụrụkpụ ihe ole m ole Charles Oputa (Charly Boy) kwuru Ihe ị kwesịrị ima maka Charly Boy Ndị nịịle nọ na kọmịtịị a bụ: Ihe Gọọmenti Anambra kwurula maka ọnọdụ udo na nchekwa ebe ahụ Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo arịọla ndị niile bu egbe akpa ike ka ha kwụsị ime etu a, kama ka ha pụta ka ha na ya nwee mkparịta ụka. O kwuru na ya dị njikere inye ha mgbaghara pụrụ iche bekee kpọrọ 'Amnesty' ma ọ bụrụ na ha dosa ngwaọgụ ha. Soludo kwekwara nkwa na ọchịchị ya ga-agbalịsị ike ịhụ na gọọmentị etiti tọhapụrụ Nnamdi Kanu, bụ onye isi ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigernous People of Biafra' (Ipob). Gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu ma jide ya na mkpọrọ n'Abuja kamgbe ọnwa June 2021. Nke a so n'ihe na-ewe ndị otu ya iwe mere ụfọdụ n'ime ha ji buru egbe malite inye nsogbu. N'otu aka ahụ kwa, gọvanọ steeti ndị ọzọ dị n'ala Igbo na ha na-agbalị ike ha iwulite ọnọdụ nchekwa na steeti ha dị icheiche. Mana ndị mmadụ ka na-ele anya ịmata mgbe mbọ niile ha sị ha na-agba ga-amịta mkpụrụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61017636 +health Coronavirus tips: Lee nkọwa puruiche maka ọrịa a Ndị mmadụ nwere ọtụtụ ajụjụ ha na-ajụ gbasara ọrịa. Bịa mata ọsịsa gbasara ajụjụ ndị gbagọjuru gị anya maka ọrịa Coronavirus. Ndị mepụtara akụkọ a bụ Chioma Nkemdilim na Vining Ogu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52241495 +politics Super Tuesday: Kedu onye 'Democrat' ga-etozu ịma Donald Trump aka? Ịchụ nta vootu maka iso zọọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka akpụrụla ọkụ n'ọnụ. Ndị Pati 'Democrat' na-achọ onye otu ha ga-ama Donald Trump aka. Taa bụ 'Super Tuesday' ka ha ga-eme ntuliaka imeụlọ na steeti 14. Onye ọbụla meriri ntuliaka a ga-agate aka na ndọrọndọrọ inweta akwụkwọ. Ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ Bernie Sanders nwere ike ituru ugo. Mana Joe Bide, nakwa Michael Bloomberg nwere ike imekwa ọfụma. Onye ka ọ ga -abụ ya na Trump? Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51712793 +business Lockdown in Nigeria: Mba ndị a emepewela: Kedụ ebe Naịjirịa kwụ? "N'ime ihe ruru izu isii maọbụ gafee (ka o sila dị) ụfọdụ mba mechiri, mba dị iche iche n'ụwa amalite imepe obere obere, na-alaghachị n'etu ndụ dị tupu ọrịa Coronavirus amalite ịkpa arụ n'ụwa. Dịka a banyere izu ọhụrụ taa bụ ụbọchị 27 nke ọnwa Epreelụ, mba ndị gụnyere Gana, Neu Zilandị na ndị ọzọ, sonyere ndị dịka Ọstrelia n'ibuli ụfọdụ mmachi ha tinyere. Ka ọ dị ugbua, BBC Igbo chọrọ ịchịkọta obodo ndị a, ịkọwara gị ihe mere ha ji emepe na ebe ha meperuru. 1) Gana: Mba a bụ agbataobi Naịjiria mechiri mgbe ọrịa a malitere inye nsogbu, mana ka izu atọ ha ji tinye iwu mmechi a gachara, onyeisiala ha bụ Nana Akufo-Addo ebuliela ya n'ụbọchị 19 nke ọnwa Epreelụ. Naanị mmadụ 19 ka ọrịa Coronavirus a gburula n'ime ihe ruru mmadụ 1,550 butere ya na mba ahụ, ebe mmadụ 155 gbakerela, nke mere o ji sị na ọ gbadoro ụkwụ na nchọpụta sayensị na ndekọ wee sị na ọ baghị uru imechi obodo niile n'ihi ọnọdụ akụnụba obodo. Ụlọakwụkwọ na okeala ka gbachiri agbachi dịka a ka machiri inwe ọgbakọ, mana ụfọdụ ụlọ azụmahịa dị iche iche ga na-emepe mana ha ga-agba mbọ hụ na ndị mmadụ nyere ibe ha ohere nke Bekee kpọrọ ""social distancing"". Ka ọ dị ugbua, Akufo-Addo kwuru na a ga-arụ ụlọọgwụ 88 n'ime otu afọ na mba ahụ ka ọrịa a gbara ike ha n'anwụ. 2) Chaịna: Onye ọbụla ma na mba a bụ ebe ọrịa Coronavirus a sị selite isi tupu ọ gazuo mbaụwa, mana ndụ alọghachitewela ya ntakịrị ntakịrị. Obodo Wuhan bụ ebe ọrịa a bu ụzọ tikapụta buliri mmachibido ịpụta ezi ha n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Epreelụ a ka ọ nọchara na mmechi ụbọchị 76, ka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a gbadara nke ukwuu. E buliri mmechi a ịma etu ha ga-esi nyere akụnụba obodo ha aka, ka ọrịa a mere ka akụnụbaobodo ha gbadaa. Mara na ọrịa a egbuola ihe ruru mmadụ karịrị puku anọ n'ime ihe karịrị mmadụ 84,000 butere ya na mba ahụ. Ka ọ dị ugbua, ụfọdụ azụmahịa emeela, ebe ụfọdụ ọdọụgbọelu nke na-efe naanị n'ime mba ahụ nakwa ụgbọoloko mepekwarala. Ụfọdụ ụlọakwụkwọ dị na Beijing na Shanghai emepekwaala dịka ụmụakwụkwọ malitere ịga akwụkwọ taa. Marakwa na ihe ruru mmadụ 1,290 nwụrụ ka e mepechara obodo Wuhan ọzọ, dịka BBC nọ na Chaịna si kwuo. 3) Nu Zilandị: Mba a banyere na mmechi n'ụbọchị 23 nke ọnwa Maachị ka ọrịa a malitere ịgazu ụwa. Nke bụ na ha nọrọ na mmechi ihe karịrị otu ọnwa na ọma tupu e bulie ya taa bụ ụbọchị 27 nke ọnwa Epreelụ. Jacinda Ardern bụ Praịm Minista mba ahụ kwuru na ha emeriela ya bụ ọrịa ""ka ọ dị ugbua"" dịka e si n'ịchọta ya n'ahụ ihe karịrị mmadụ iri gbadaa n'ịchọta ya n'ahụ ihe na-erughizi mmadụ iri kwa ụbọchị - ma chọta ya n'ahụ naanị otu onye ụnyaahụ bụ 26 Epreelụ. Ardern kwuru sị ""Anyị na-emepe obodo n'ihi akụnụba, mana anyị anaghị emepe ya maka mmekọrịta na egwuregwu ndị mmadụ"" Site n'echi bụ ụbọchị 28 nke ọnwa Epreelụ, ụfọdụ azụmahịa na-abụghị ndị kacha mkpa n'oge a, ndị nlekọta ahụike nakwa ụfọdụ ihe gbasara agụmakwụkwọ ga-amalite. 4) Ọstrelia: Mba banyere na mmechi n'ụbọchị 22 nke ọnwa Maachị, dịka ọrịa a malitere ịgbasa, mana ha malitere imepe ụfọdụ ebe n'ụbọchị 20 nke ọnwa Epreelụ. Na mba a, e mepeela ụfọdụ ọnụ mmiri (beach), bido n'ụbọchị Satọdee na-abịa, obodo dị ka Queensland ga-ahapụ ka ụlọahịa ndị na-ere ihe dị ka akwa na ihe ndị ọzọ mepee. Ka ọ dị ugbua, ha ewepụtala nke a kpọrọ ""Covidsafe contact tracing app"" bụ nke ga-egosinwu mmadụ ma ya na onye bu ọrịa a nọrọ nsọ ihe karịrị nkeji 15. Scott Morrisonbụ Praịm Minista sị na ha nwereike ibulicha mmechi a ma ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ but up ya bụ app n'ekwentị ha. 5) Spen: Mba a so na ndị ọrịa a gwọrọ ara ka o rutere ha aka. Mana ugbua isi ha na ha apụta obere obere. Ha banyere na mmechi obodo n'ụbọchị 27 nke ọnwa Maachị, mana kemgbe ụbọchị 13 nke ọnwa Epreelụ ha ejirila nwayọ nwayọ na-emepe. Naijiria anọọla na mmechi kemgbe otu ọnwa na ụma dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị gọvanọ ndị ọzọ tinyere iwu mmachibido. N'ime izu anọ a, ọtụtụ ndị agabeghi ọrụ nke ahịa dị iche iche ji emepe (a hapụrụ naanị ndị ahịa nri). Nke a pụtara na akụnụba obodo a na ha akụ afọ n'ala maọbụ ji otu ụkwụ kwụrụ. N'ime nke a, ụfọdụ etisiwela mkpu ike ka e mepee obodo, mana oge eruola? Tupu mba ndị a edepụtara n'elu emepewe ha mere ụfọdụ ihe iji chekwa onwe ha. Ịma atụ, Gana bu ụzọ nyochaa ihe ruru mmadụ puku iri isii tupu ha ekpebie ibuli mmachi a, ebe Naijiria nyocharala naanị ihe ruru mmadụ puku iri. Nke a mere a ga-eji jụọ ""Naijiria nwere ihe ruru mmadụ nde narị abụọ enyocharuola mmadụ ole ha kwesịrị inyocha tupu ha amara ma ọrịa eruola etu e nwereike iche?"" Ihe mba ndị dị ka Spen, Ọstrelia na ndị ọzọ hụrụ tupu ha ekpebie ibuli mmachi ha obere obere, bụ na ndị nwụrụ anwụ bịara ruo otu ogogo nke bụ na a bịara nwee mgbe ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa Coronavirus a karịrị akarị, mana o ruchara otu ihe n'ime ihe dị ka otu izu, tupu ọ bịa dawakwa ọzọ. Mana ka ọ dị ugbua, enwebeghi ike ikwu ma Naijiria eruola ogogo ahụ ma ya fọdụzịa ịdawa. Na mba ndị ahụ ugbua, ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a na-adazị ada karịa ogogo o ruburu mbụ, ịma atụ bụ mba Nu Zilandị, mana Naijiria ka nọ na ọ daa taa, ọ rịa echi." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52430297 +sports Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Anthony Joshua emeriela n'ọkpọ Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a: Ndị uweojii Enugwu steeti anapụtala ndị mmadụ egbe karịrị otu narị Ndị uweojii n'Enugwu steeti kpokọtara egbe gụnyere AK47, double barrel, nakwa pump action Iji rube isi n'iwu onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Ibrahim Idris nyere gbasara ịchịkọta egbe dị n'aka ndị nkịtị. Onye kọmịshịọna ndị uwe ojii n'Enugwu bụ Danmallam Mohammed gosiri ndị ntaakụkọ egbe niile ndị ahụ, nke o kwuru na ha napụtara ndị mmadụ iji wee chekwaa ndụ na akụnaụba ndị ala anyị. Egbe na ngwa ọgụ ndị ahụ gụnyere; Ak 47 iri, pump action iri na atọ, pistol otu barrel iri atọ na atọ, double barrel iri atọ na isii, egbe mkpụmkpụ ebere ọnụ asatọ, revolver atọ, baretta pistol iri na otu, egbe ogologo otu barrel iri na asatọ, ngwo ngwo egbe ndị ọzọ, nakwa mgbọ egbe mejuputara ọnụọgụgụ. Onyeisi otu pati PDP bụ Uche Secondus enyela mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed ụbọchị abụọ iji kwugharịa ebubo e boro ya maọbụ ọ gbaa ya akwụkwọ. Mohammed boro Secondus ebubo na ọ natara nde narị abụọ n'ụlọọrụ onye ndụmọdụ n'ihe gbasara nchekwa n'afọ 2015. Na mba ofesi Mba Russia na ndị nnupuisi n'obodo ọdịda-anyanwụ Ghouta dị na Syria ekwekọrịtala na ha ga-achili aka elu. Aka a ha chiliri elu ga-enye ohere ka e nwee ike si n'obodo Douma bupu ndị merụrụ ahụ ma nwekwaa ike ịga n'obodo ndị ọzọ. Nwaafọ Naịjiria na-anọchite anya ndị Britain bụ Anthony Joshua meriri n'ọkpọ 'world heavyweight' ọ kụrụ. Joshua meriri Joseph Parker bụ onye New Zealand n'ọkpọ ha kụrụ n'isi ụtụtụ taa. Mmeri a o meriri, nyere ya ihe nrite WBO, nke mere ka o soro na ndị na-akụ ọkpọ nwere ihe nrite WBA, IBF nakwa WBO nke ndị agba heavyweight na mbaụwa. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Ishiagụ ọ na-ekwesi ụmụnwaanyị ka ọ bụ nanị ụmụnwoke kwesiri ị na-eyi ya? https://www.bbc.com/igbo/afirika-43610268 +health Flu Virus: 'Bird flu', swine flu, SARS na ọrịa ndị ọzọ mara ụwa jijiji "Ndị ọrụ sayensị na Chaịna achọpụtala ụdịrị ọrịa ụkwara ọhụrụ nwereike ị zu ụwa ọnụ. A chọpụtara ọhụrụ n'ahụ ezi mana o nwereike ị fee ndị mmadụ dịka ha si kwuo. Dịka ọ dị ugbua ndị ọrụ ahụ na-eche na o nwereike ịgbanwe ma ghọrọ ọrịa ga-efe efe ma zuo ụwa ọnụ n'oge adịghị anya. Akpọbeghị ọrịa aha ọbụla ugbua mana lee ọrịa ndị ọzọ yiri ya mara ụwa jijiji ebe a: Ọrịa a malitere n'afọ 1918 mgbe a na-anụ agha ụwa nke mbụ bụ WW1 bụ nke metụtara ngụ ndị mmadụ. Ọ bụ ọrịa a tụrụ egwu nke ukwu n'ihi na o gburu ugboro abụọ ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'agha ahụ, ya bụ ihe ruru mmadụ nde iri ise nwụrụ. A kpọrọ ya ""Spanish Flu"" mana ndị sayensi niile ekweteghị n'aha a n'ihi na rue ugbua, amabeghi ebe o si welite isi. Ọrịa nke a malitere n'afọ 1957 na mpaghara ọwụwa anywanwụ Eshia dịka aha ya si kwuo. Ọ pụtara n'ahụ nnụnụ tupu o bido i fee ndị mmadụ dịka ọrịa ụkwara nakwa ngụ. O gburu ihe ruru mmadụ otu nde na ọma n'ụwa niile Nke a yiri ọrịa ""Asian Flu"" n'ihi na o si kwa n'ahụ nnụnụ pụta ma bụrụkwa ọrịa ngụ. O gburu ihe ruru mmadụ otu nde n'ụwa ma siri kwa na Hong Kong pụta dịka aha ya si gosi. O bu ụzo senyie isi n'afọ 1957. Ọrịa SARS pụtara ""Severe Acute Respiratory Syndrome"" na Bekee maọbụ ọrịa ike nke ngụ malitere n'afọ 2002. A chọtara n'ahụ ụsụ n'Eshia ebe o fere mmadụ puku asatọ na ọma. Ọ malitere iwu ọzọ n'ihi na ngosiputa ya yiri nke Covid-19 na-ewu ugbua. Ọrịa ngụ nke a malitere n'ahụ ezi na mba Amerịka metụtara ụmụaka na ndị ntorobia kachasị. E chere na o fere ihe ruru mmadụ nde narị asatọ ma gbuo mmadụ puku narị abụọ na iri asatọ na anọ. E bu ụzọ chọpụta ya n'afọ 2009. Ọrịa MERS pụtara ""Middle Eastern Respiratory Syndrome"" na Bekee bụ ọrịa echere na ọ pụtara n'ahụ ụsụ. A kpọrọ ya MERS n'ihi na ọ bụ na mba Saudi Arabia ka o si malite ma fesaa na mba iri abụọ na ise. Ngosiputa ya yikwara nke SARS nakwa Swine Flu n'ihi na ha niile si n'otu ezinaụlọ nje. Covid-19 bụ ọrịa nke ụwa nille ka na-agba mgba rue ugbua. A chọpụtara mbụ n'ọnwa Disemba afọ 2019 n'obodo Wuhan dị na mba Chaịna. O nwetara aha ya n'ihi na o si na ezinaụlọ nje akpọrọ ""coronavirus"" ma malitekwa n'afọ 2019 (Covid-19) Dịka ọ dị ugbua, o feela ihe karịrị mmadụ nde iri ma gbuo ihe ruru mmadu puku narị ise. Akụkọ ndị ga-amasị gị" https://www.bbc.com/igbo/afirika-53239267 +politics Governor Charles Chukwuma Soludo: Ihe ndị Anambra steeti chọrọ n'aka ọchịchị ya Ụfọdụ ụmụafọ Anambra Steetị ekwuola ihe ha chọrọ n'aka Charles Soludo dịka a ga-edu ya n'iyi ọrụ gọvanọ n'ụbọchị 17 Maachị, 2022. Soludo meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra nke e mere n'ọnwa Nọvemba afọ 2021. BBC Igbo gara n’isi obodo Anambra Steeti bụ Awka ịchọpụta ihe bụ olileanya ndị mmadụ n'ebe ọchịchị Soludo nọ n'ime afọ na-abịa abịa. Otu nwokorọbịa na nwagbọghọbịa sị na ha chọrọ ka Soludo leba anya n'ihe banyere nchekwa obodo, ọkachasị ndị otu nzuzo na-akpa ike n'Awka na gburu gburu ya. Otu nwaanyị na-ere ahịa mbugharị sị na ọ chọrọ ka Soludo binye ndị na-azụ ahịa ego iji kwalite azụmahịa ha. Ụfọdụ ndị ọzọ kwukwara na mmepe obodo, mmụbawanye akụnaụba na ihe ndị ọzọ bụ mkpa ha chọrọ ka Soludo gboo n'ime. Anambra steeti so na steeti ndị di n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ebe azụmahịa nakwa iji ego chụọ ego bụ isi mmiri akụnaụba ha. Gere ihe ha kwuru n’uju n'ime ihe onyonyo a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-60767426 +politics Nasir El-Rufai: Sheikh Gumi amaghị ihe ọ na-akọ, ihe kwesịrị ndị 'bandits' bụ ọnwụ "Gọvanọ Kaduna Steeti bụ Nasir El-Rufai ekwuola na ya ekwenyeghị ihe Sheikh Ahmed Gumi na-ekwu na gọọmentị kwesịrị ịgbaghara ndị ekperima a kpọrọ bandits. El-Rufai kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'ụbọchị Mọnde. Cheta na Sheikh Gumi, onye ụkọchukwu a ma ama n'okpukperechi alakụba, kwuru na gọọmentị kwesịrị ịkpọ ndị ọchịehi a na-akpa ike ma gbaghara ha. Mana El-Rufai kwuru na onweghị mgbaghara dị n'etiti gọọmentị ya na ndị ekperima. ""Mụ na Sheikh Gumi bụ enyi, mana agwala m ya na ọ na-egbu onwe ya oge n'ihe a ọ na-akọ maka ịgbaghara ndị ekperima ọchịehi."" ""Ekwenyeghị m na onye ọchịehi tinyere aka n'ịtọrọ mmadụ, ma na-anatakwa nde kwuru nde naịra n'aka ndị ọ na-atọrọ, ga-emechaa chegharịa."" ""Onye ọbụla che na onye ọchịehi na-erete ihe dịka otu narị puku narịra (N100,000) kwa afọ, mana ugbua ọ na-anatazi nde kwuru nde naịra n'ọrụ ịtọrọ mmadụ, ga-echegharị, onye ahụ na-egbu onwe ya oge."" ""Ọchịchị Kaduna steeti na ndị ekperima nọ n'agha. Anyị na ha agaghị enwe mkparịtaụka ọbụla. Naanị ikpochapụ ha bụ ụzọ anyị ga-esi kwụsị ha."" Nasir El-Rufai kwuru na ihe na-enye nsogbu n'ibuso ndị ekperima agha na mpaghara Ugwu bụ maka na ndị gọvanọ mpaghara ahụ adịghị n'otu. Mana ugbua, El-Rufai kwuru na ya na gọvanọ Niger Steeti ejikọọla aka ọnụ ịlụ ya bụ ọgụ. Lee akụkọ BBC Igbo mere n'afọ 2019 gbasara mwakpo ndị ekperima wakporo otu obodo na Kaduna steeti ma gbuo mmadụ iri isii na isii. Ndị uweojii Naịjirịa kwuru na ha enweghi ike ịkọwanwu ugbua ma mmadụ 66 anwụrụ n'ezie n'okpuruọchịchị Kajuru dị na Kaduna steeti. Yakubu Sabo bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Kaduna steeti, gwara BBC na kọmishọna uweojii ga-agwa ndị ntaakụkọ okwu gbasara ya taa. BBC kpọkwara Ishaya Chinoko bụ onye na-elekọta mpaghara ugwu-ndịdaanyanwụ nke ụlọọrụ gbatagbata nke a kpọrọ ""National Emergency Management Agency (Nema), onye kwuru na ha amaghị na ụdịrị ihe ahụ mere . O kwuru sị ""dịka m na-agwa gị okwu ugbua, Anọ m na Kaduna steeti mana anụbeghi m ihe dị otu ahụ na mmadụ 66 nwụrụ. ""Ọrụ anyị bụ ilekọta ndị a gbara ọsọndụ, nke bụ na ọ bụrụ na ihe ruru mmadụ ole ahụ nwụrụ, ndị mmadụ gaara agbapụta n'ogige ahụ nke ga-eme ka anyị wụchie."" Ọkammụta Chidi Odinkalu bụbụ onyeisioche otu na-ahụ maka ikike dịrị onye nke a kpọrọ ""National Human Rights Commission"", tinyekwara ọnụ ya n'okwu a na Twitter, ebe o kwuru na o cheghi na ihe dị etu a mere. Mana El-Rufai tinyere na Facebook ya, foto ọ sị na-egosi ka ya na ndị agha gara mgbaru n'obodo ahụ e gburu ya bụ mmadụ 66. Cheta na El-Rufai kwuputara n'ụbọchị Febrụwarị 15 na mmadụ 66 nwụrụ na steeti ya. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-47272114 +health "Breast Cancer: ""Amaghị m na onye dị afọ iri abụọ nwere ike ịrịa ọrịa kansa""" "Mgbe Lucy chọpụtara akpụ n'ara ya,o cheghịdị echiche na ọ bụ ọrịa kansa. Ọzọkwa, nchọpụta nke akpụ ara bụrụ ya ""ihe mberede."" Ọ naghị emekarị nnyocha ara ya mgbe niile. Mgbe ọ hụchara dọkịta, Lucy nwetara akụkọ ọjọọ na o nwere ọrịa kansa ara. Lucy dị afọ 26, gwara onye ntaakụkọ BBC bụ Kirsty Grant, na ""Echere m na m nwere ike ịmalite ime nke a mgbe m dị afọ 50"". N'ọnwa Septemba 5, 2021, onye bụbu onye egwu Britain ""Song Girl"" Sarah Harding nwụrụ n'ihi ọrịa kansa mgbe ọ dị afọ 39. Mgbe akụkọ ahụ pụtara n'akwụkwọ akụkọ, ọnụego pịa nke webụsaịtị nke ọrụ ebere ọrịa kansa ara Britain CoppaFeel mụbara nke ukwuu. N'ime awa iri na abụọ ka Sarah nwụsịrị, mmadụ 200,000 gara na websaịtị ahụ, mmụba nke okpukpu asatọ nke okporo ụzọ a na -emebu. CoppaFeel gwara BBC na n'agbanyeghị na ọrịa ara bụ ọrịa kansa kachasị n'etiti ụmụ nwanyị gbara afọ 25-49, otu ụzọ n'ụzọ anọ nke ndị na-eto eto amaghị na ọrịa ara na-emetụta ha; ụmụ agbọghọ bụkwa ndị mmadụ nwere ike gbuo oge ịhụ dọkịta. ""Dọkịta ahụ gbachiri nkịtị."" Nchọpụta Lucy chọpụtara akpụ akpụ ara bụ ihe mberede. Ọ dabara na ọ nọ na -ezu ike n'ụbọchị ahụ wee nwee ohere ịhụ dọkịta. Ọ sịrị, ""Anọ m na -eche maka ya, obi dị m ụtọ na enwere m izu ike n'ụbọchị ahụ. Ọbụlagodi mgbe dọkịta rịọrọ Lucy ka ọ nyefee ya n'ụlọ ọgwụ ara, ọ ka echeghị gbasara ọrịa ara. Mana nwanne m nwanyị siri ọnwụ na a ga -ahapụ ya ka ọ gaa nyocha ultrasound. Mgbe ahụ, Lucy malitere ịghọta ịdị njọ nke nsogbu ahụ. ""Dọkịta ahụ gbachiri nkịtị,"" ka o kwuru. Otu izu ka e mesịrị, a gwara Lucy na ọ bụ ọrịa kansa. N'oge na -adịghị anya, mkpụrụ ndụ kansa ahụ na -agbasa ruo n'ọkpụkpụ lymph. Dọkịta ahụ gwara Lucy na ọ chọrọ kemoterapi, radiotherapy na ịwa ahụ. Ọ sịrị, ""Mgbe ụfọdụ anaghị m enwe ike iri nri ma ọ bụ hie ụra."" Mgbe ụfọdụ enweghị m ike ịrahụ ụra awa iri abụọ n'ụbọchị, dina n'ihe ndina, enweghịkwa m ike imegharị ahụ. ""Anọ m na -ele anya nke ukwuu, akpụkpọ ahụ m dịkwa egwu. Etufuru m ntutu m, na ntutu m niile, gụnyere nku anya na nku anya."" Mgbe a wasịrị ya ahụ na ịwa ahụ ọkụ, Lucy mechara nweta ozi ọma: ọnweghị mkpụrụ ndụ kansa. ""Echela na ọ gaghị eme gị"" Lucy ka na -anara ọgwụgwọ homonụ ma na -arụkọ ọrụ na CoppaFeel ime ka ọtụtụ mmadụ mara na ọrịa ara nwekwara ike imetụta ụmụ agbọghọ. ""Echela na ọ gaghị eme gị. Ọ naghị eme gị enweghị nchekwube, ọ na -eme ka ị mụrụ anya karịa,"" Lucy kwuru. Lucy na-atụkwa anya ime ka ụmụnwaanyị ndị ọzọ nọ n'ọchịchị ojii ghọta mkpa ọ dị inyocha onwe ha nke ara. O kwuru na a ka nwere ọtụtụ ihe na -esiri ndị mmadụ ike ịkọ gbasara ọrịa ara, yabụ na ndị mmadụ achọghị ikwu maka ya. Mana o kwuru na ọ dị mkpa ikwu gbasara ọrịa kansa. Lucy kwuru na ihe ndị na -akwalite ọrịa kansa anaghị ahụkarị ụmụ nwanyị ojii, na ha anaghị achọ ikwu maka ọrịa kansa. Lucy kwuru, ""Ọ dị m ka ọ gaghị eme anyị."" ""Abụ m ihe akaebe dị ndụ"" Fran, afọ 24, echeghị na ọ ga -enweta ọrịa ara ure dị ka nwata, ruo mgbe ọ hụrụ ntụpọ n'obi ya. Na mbido, dọkịta ahụ etinyeghị uche na ya wee sị na ọ bụ naanị akpụ ""homonụ"". Ọ bụ ka ọnwa iri na asatọ gachara ka o nwere mgbaàmà ndị ọzọ wee laghachi ịhụ dọkịta ọzọ. N'ihi na ezipụla ya n'ụlọ, Fran achọghị ịlafu oge dị oke ọnụ na NHS (National Health Care System). Agbanyeghị, ka emechara ọtụtụ nyocha na nyocha ultrasound, a chọpụtara na Fran nwere ọrịa kansa ara 4, yana etuto ụbụrụ. Dọkịta gwara ya na ọ ka nwere afọ 2 ka ọ gaa. ""Adị m naanị afọ 25. Abụ m onye na -enye mgbatị ahụ. Ọ bụ mgbe m nwere ahụike kachasị mma."" Fran kwuru, ""Abụ m ihe akaebe na -egosi na ọ nwere ike ime onye ọ bụla na ndị ọgbọ ọ bụla."" Mgbe Fran gacharala '' ọtụtụ ọgwụgwọ kemoterapi '', ọrịa kansa ahụ nọ ugbu a n'ọnọdụ mgbaghara. Ọ kọọrọ akụkọ ya na ntanetị wee gwa ndị mmadụ na ụmụ agbọghọ na -enwetakwa ọrịa ara ure. Ọ sịrị, ""Ekesara m ọrịa m n'ihu ọha na social media wee dekọọ ihe niile m nwetara."" Fran kwuru na ọ na -adị ka ndị mmadụ na -egosi ọrịa ara ure dịka nsogbu ndị okenye nwanyị na -ezute. ""Tupu afọ a, echere m na ekwesịghị m ichegbu onwe m maka ọrịa kansa ruo mgbe m mere agadi.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-58821240 +politics Onyeisi ndị ntorobịa pati APC Enugwu enwerela onwe ya "Onyeisioche otu Pati APC n'Enugwu state bụ Ben Nwoye ekwuola na onyeisi ndị ntorobịa Pati ahụ bụ onye ndị uweojii nwụchiburu, enwerela onwe ya. Ben Nwoye kwuru na nwa amadị a aha ya bụ James Nwanjoku Okugo nweere onwe ya n'ụbọchị Tuzde, abalị asaa nke ọnwa Eprel 2020. Cheta na Ben Nwoye gweburu BBC Igbo na ọ bụ Geofrey Onyeama, bụ mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ, nyere iwu ka a nwuchie Okugo ma tụọ ya mkpọrọ. Nwoye kwuru na Onyeama boro Okugo ebubo na o ji aha ya agba asịrị na-ekwu na ya bụ Onyeama bu ọrịa coronavirus. N'oge mbụ anyị na Okugo nwere mkparịtaụka, ọ kpọkuru Onyeisiala Muhammadu Buharị ka o nye aka mee ka atọhapụ Okugo. Ka otu ụbọchị gachara BBC Igbo dere ya bụ akụkọ, Nwoye ziteere anyị ozi ekele na-ekwu na atọhapụla Okugo. Onyeama bụ Minista na ahụ maka mba ofesi. Nwoye sị na ọkaikpe Onyeama bụ Kelechi Onyia ben agwabuola Okugo ya kwugharia ya bụ okwu tupu abalị abụọ agaa. Mana ha enweghịzị ndidi chere oge ahụ tupu ha jiri ndị uweojii si Abuja bịa kpụrụ ya. Ọ sị, ""Okugo sị na ọbụghi ya kwuru okwu a n'izizi. Na ihe mere bụ na ya hụrụ ka a na-ekwu were jụọ ajụjụ ma ọ bu eziokwu."" Nwoye sị ""anyị atụghị anya na Minista ga-eme otu a ebe iwu gbochiri ịkpụrụ mmadụ n'ihe na-enweghị isi n'oge ụgbụa"". Ọ rịọrọ Onyeisiala Muhammadu Buharị ka ọ gbata ọsọ enyemaka mee ka atọhapụ Okugo ozugbo. Ọ sịrị na ọ bụ ndị uweojii si Abuja bịara njem a, ma jụọ ""ọ bụ kita onyeisi ndị uweojii sị ka atụghapu mmadu ka a na-ejide mmadụ?"" Ọ sịkwa na ọbụghị na onye ahụ gburu mmadụ maọbụ na o ji egbe gaa ozi. O kwukwara na ha na Okugo akpaala n'ekwentị kemgbe ọ hapụrụ. Nwoye sị na ihe kacha atụ ha egwu bụ na-enwere ike ibunye Okugo nje coronavirus mgbe ọ ga-alọta. Ọ sị, ""Onyeama sibu na ya ga-agba akwụkwọ, mana kama o ga-eme nke a akpụrụ nwaamadi a gawa Abuja tinye ya na mkpọrọ. ebe owereike nọrọ bute coronavirus."" BBC Kpọrọ ndị uweojii Engwu steeti mana ha sị na ya bụ nwuchi nwaamadị adịghị ha n'aka. Nwoye jikwara onyeisiala Buhari maa atụ were sị na eji kwa ya kwuo okwu nke gunyere ị si na ọ nwụọla. Anyị kpọkwara ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Naịjirịa, Frank Mba bụ onye sị na ya amabeghị ihe gbasara ya. Mana ya ga-achọpụta. Akara ekwentị Geoffery Onyeama na-akụ mana ọnaghị aza ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52182504 +politics Professor Charles Chukwuma Soludo: Ihe i kwesịrị ịma maka onye ga-achị Anambra steeti Charles Chukwuma Soludo bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti n'okpuru pati APGA. A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Julaị 1960, n'ezinaụlọ Nze Nwankwo Simeon Soludo na Oriakụ Mgbafọ Soludo, nke obodo Ụmụeze dị n'Isuọfịa, n'okpuru ọchịchị Agụata dị n'Anambra steeti. Ọkammụta Soludo kọwarala anyị ihe dị n'ime aha otutu ya bụ 'Charley Nwa Mgbafọ'. Soludo gụtara asambodo ọkammụta n'ihe gbasara Akụnaụba obodo (Economics) na mahadum Naịjiria dị na Nsukka ma na mahadum ndị dị na mba ofesi, chịrị ụlọakụ kachasị na Naịjiria bụ Central Bank of Nigeria site n’afọ 2004 ruo 2009. Ya na nwunye ya bụ Nonye Queen Frances Soludo mụtara ụmụ isii. Ka ọ dị ugbua, Soludo na-emeri n'okpuru ọchịchị iri na otu (11) n'ime iri abụọ na otu (21) dị n'Anambra steeti ugbua, dịka ụlọọrụ Inec si kpọpụta. Nke a abụghị mbụ ọ na-apụta ịzọ ọkwa gọvanọ n’Anambra steeti dịka ọ nwara n’afọ 2010 n’okpuru PDP, mana Peter Obi meriri ya. Ọ nwakwara n’afọ 2013 n’okpuru APGA, mana ndị nnyocha otu pati ahụ kwuru na o tozughi. https://www.bbc.com/igbo/afirika-59200285 +entertainment Tacha: A kụpịala Tacha ka ya na Mercy lụchara ọgụ A chụọla Tacha n'ụlọ Big Brother ka ya na Mercy kọchara ọnụ n'ụlọ Big Brother Naija n'ụbọchị Fraịde. Iwu e tiri n'egwuregwu BBNaija bụ na onye ọbụla kpara ibe ya aka n'ahụ ga-alarịrị. Ndị mmadụ malitere ịkpọ oku ka a chụpụ Tacha n'ihi na ọ dọrọ Mercy aka na ntutu isi mgbe ha abụọ kọrọ ọnụ n'ehihie Fraịde. Mana ụfọdụ che na agaghị achụpụ ya n'ihi na o nwere ọtụtụ ndị nkwado. Lee ihe ndị mmadu kwuru maka #Tacha, #BBNaija19, #BigBrotherNaija, #BBNaijaEviction na nchụpụ a chụpụrụ Tacha n'abalị a: @MaziIbe_ kwuru na: @Zaddy_nomso kwuru na ọbụ ugbua ka egwuregwu Big Brother malitere. @Icmuha kwuru na onweghị onye ọ ga-ewute maka nchụpụ a chụpụrụ Tacha. @PoojaMedia kwuru na nchụpụ Tacha bụ ikpe ziri ezi. Mana obi adịghị ndị na-akwado ya mma, dịka onye a: Ihe niile a mere wutere Tacha nke mere o ji wee rịọ ka ndị mmadụ gbaghara ya n'agwa ọjọọ niile ọ kpara n'ụlọ Big Brother Naịja. O mere nke a site n'akara Instagram ya bụ ebe o kelere mmadụ niile dọnyere ugwu n'oge ọ n'ime ụlọ a. Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-49855499 +entertainment Nigerian Celebrities: Ndị a ma ama ụzụ tụrụ n'isi ha n'izu a "Igbo na-atụ ilu sị na ""ọ bụrụ na mmadụ ekoteghI, ọgọdọ ya ekotere ya"". Nke a bụ etu ọ dị ụfọdụ ndị a ma ama dịka ụzụ tụrụ n'isi ha n'izu a, n'ihi otu ihe maọbụ nke ọzọ, nke ha kpatara n'aka ha nakwa nke ndị onye ọzọ kpatara ha. Ngwa ka anyị tụlee ụfọdụ ndị a nakwa ihe mere aha ha ji daa ụda n'izu a. Burna Boy Burna Boy bụ nwokoroọbịa a ma ama n'iti egwu, ụfọdụ na-akpọ ya 'African giant' n'ihi nturuugo o riterela n'iti egwu. Ihe mere na aha Burna Boy ji daa ụda n'izu a bụ maka na ọ sị na ọ ga-aga mba Saụt Afrịka gaa tie egwu n'emume a kpọrọ 'Africanunite'. Nke a mere ka otu onye otiegwu na Saụt Afrịka a kpọrọ AKA ji sị ka Burna Boy rịọ ndị mba ha mgbaghara tupu ọ na-ama ụkwụ na Saụt Afrịka. AKA sị na ọ bụ maka ihe Burna Boy kwuru oge ndị Saụt Afrịka na-awakpo ndị Naịjirịa na ndị mba Afrịka ọzọ bi n'obodo ha. Nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji kpụrụ aha Burna Boy n'ọnụ na soshal midia n'ụbọchị 14 Nọvemba, 2019. Davido David Adeleke bụ onye e ji Davido mara na-etikwa egwu ndị a na-anụ ụda ha na Naịjirịa, Afrịka nakwa mba ụwa gbagburugburu. O gụrụ nwa nwoke ọ mụrụ ọhụrụ aha na Lọndọn, o kpọrọ aha ya 'David Adedeji Ifeanyichukwu Adeleke Jnr'. Ihe ọzọ mere aha Davido ji tụọ ụzụ n'izu a bụ foto o gosiri ebe ọ zụnyere ndị otu ya ihe, nke mere ndị mmadụ ji etu ya ""ome ọgọ nke mbụ"". Sylva Ukaatu bụ onye na-eme ejije kwuru ihe mere ọtụtụ ndị mmadụ kachasị ụmụnwaanyị ji kpụrụ ya n'ọnụ n'izu a. Ọ sị na ụmụnnwaanyị ezughi ezu maọbụrụ na nwoke anọghị ha n'akụkụ, ya mere ka nwagbọghọ gbalịa lụọ di ọ bụrụgodi ịbụ nwunye nke atọ. Enyinnaya Abaribe Sịnetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye na-anọchiteanya Abia South n'ụlọomeiwu kwuru okwu dara ụka n'izu a mgbe o tinyere ọnụ n'iwu ọhụrụ a chọrọ ime maka okwu ịkpọasị na Naịjirịa. Iwu a sị na a ga-akwụ onye ọ bụla kwuru okwu ịkpọasị ụdọ. Mana Abaribe sị na ọ bụrụ na iwu dị kamgbe 2012 na Lai Mohammed ọ gara adị ndụ ugbua? Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji kpụrụ aha Enyinnaya Abaribe n'ọnụ. Hilda Dokubo Hilda Dokubo bụ nwaanyị malitere ime ihe nkiri mgbe gboo pụtakwara ihe taa n'ihi mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere. Hilda tinyere ọnụ n'okwu banyere ihe ọ na-eme ugbua, mwereonwe Biafra nakwa ihe ndị ọzọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50436951 +health "Health Workers Hazard Allowance: Ego ole a kwụrụ maka ""hazard fee "" abụghị mkpa anyị ugbua - Onyeisi NMA" Onyeisi otu chịkọtara dọkịta niile nọ na Naịjirịa bụ Innocent Utah ekwuola na ego ọrụ mgbadume gọọmenti kwadoro inye ndị ọrụ ahụịke dị mma mana ọ bụchaghị ihe ka ya na ndị otu ya mkpa ugbua. Utah kwuru na egole ọbụla gọọmenti etiti kwụrụ maka ọrụ mgbaụgbanụ ha na-arụ bụ ihe ha kwekọrịtara. O kwuru na ihe ka ha mkpa bụ ka gọọmenti mee ihe ga-eme ka ahụike ���mụ Naịjirịa dị sam site na ihe ha ga-eme ka ọnọdụ ngalaba ahụike dị mma karịa etu ọ dị ugbua. Ujah kwuru na gọọmenti kwetere na ọrịa covid-19 emeela ka ụwa hụ nnukwu nsogbu dị ngalaba ahụike Naịjirịa. N'okwu ya, ugbua bụ oge ekwesiri iji wee tinyekwuo akụrụngwa eji agwọ ụmụ Naịjirịa ọrịa karịa etu esi eme na mbụ ma zụọkwa ndị ọrụ ahụike, Kọmịshọna ahụike Abia steeti bụ Jonathan Osuji kwuru na steeti ha ebidolarị kamgbe na-akwụ ndị ọrụ ahụike ha ụgwọ ọrụ mberede kwa ọnwa. O kwuru na gọọmenti etiti gwabụrụ steeti ka ha na-akwụ ndị ọrụ ahụike puku naira ise kwa ọnwa mana ka covid-19 sepụtara isi ha kwuru na ha ga-elebanya n'ego ahụ maka ịgbanwe ya. Osuji kwuru na steeti ha amaghị ihe gọọmenti etiti kpebiri ugbua dịka ego mkpachanye ọrụ gbanụgbanụ ndị ọrụ ahụike mana Abia na-enye ndị niile na-arụ ebe a na-agwọ coronavirus ezigbo ego kwa izu ụka maka ntachiobi ha. O kweghị ekwu egole ọ bụ. Kọmịshọna ahụike nke Imo, Enugu, Ebonyi nakwa Anambra azaghị ekwenti ha mgbe anyị gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ha gbasara ya bụego mkpachanye ọrụ gbanụgbanụ. Anyị gbalịkwara ịnụta n'ọnụ mịnịsta ahụike nke Naịjirịa bụ Ehanire Osagie mana o zaghị ekwenti ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52992434 +sports Arsenal vs Manchester United: 'Pepe' ndị Arsenal agbaala Manchester United ose n'anya n'afọ ọhụrụ Ọbịbịa Mikel Arteta dịka onye nkuzi ndị otu egwuregwu bọọlụ Arsenal amalitela ịmịta mkpụrụ. Arsenal ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie Manchester United n'abalị Wenezde. Nke a bụ mmeri mbụ Arteta na-enweta kamgbe ọ malitere ọrụ n'Arsenal. Pepe nyere goolu nke mbụ ka ọ gachara nkeji asatọ ya bụ asọmpi malitere. Ka ọ gachara nkeji 42, Sokratis Papastathopoulos nyere goolu nke abụọ. Nke a bụ mmeri nke mbụ Arteta na-enweta kamgbe ọ malitere ọrụ dịka onye nkuzi ndị Arsenal. Mmeri a mere ka Arsenal gbagote n'ọnọdụ ndị nke iri na tebulu 'English Premier League'. Pepe, bụ onye Arsenal ji nde paụnd 72 zụta n'ọnwa Ọgọst ritere nzere ọkacha agba na ya bụ asọmpi. Ọ bụghị naanị na Pepe nyere goolụ na asọmpi a, ọ gbakwara bọọlụ kụrụ n'igwe. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50970138 +politics Nigeria Independence: Lee etu Nigeria na mba Africa ndị ọzọ nweere onwe ha na 1960 si kwụrụ "Dịka Naijirịa na-eme emume nnwereonwe, ụfọdụ na-ajụ kedụ ebe Naijirịa nọ n'ihe gbasara ọganihu. Ha dị ọtụtụ mba n'Afrịka ha na Naịjirịa nweere onwe ha n'afọ 1960. Ha gunyere Gabọn, Mọritenịa, Mali, Bene Repụbụlik, Senigal na Togo. Mba ndị a na-akwadokwa emume ịgba afọ 59 nke ha. Mba ndị a niile bụ ọgbọ mana Igbo si na ""nwoke na ibe ya ha bụ n'ọnụ"". Ọ bụrụ n'omenala Igbo, onye gbara afọ iri ise na itoolu ekwesila imezu ihe a tụrụ anya na ndụ ya. Na ntule anyị mere, anyị chọrọ ịchọpụta mba kacha eme nke ọma. Ihe ndị anyị ji mee nchọpụta a gụnyere ọnwụ ụmụaka amụru ọhụrụ nke Bekee kpọrọ ""Infant Mortality"", ogologo afọ ndụ (life expectancy), ụgwọ opekatampe (minimum wage) na nrụrụaka (corruption). Anyị jụkwara onye ọkammụta n'ihe gbasara akụnụba mba bụ Mazi Samuel Iheanyichukwu Ohuabunwa na Dọkinta na-ahụ maka ahụike obodo bụ Ikenna Onoh. Ọnwụ ụmụaka a mụrụ ọhụrụ ka njọ na Naịjirịa karịa mba ndị ọgbọ ya. Dịka ndị 'Worldbank.org' si depụta n'afọ 2018, Naijirịa jiri akara 75.7 were bụru onye nke ikpeazụ ebe Senegal bụ onye nke mbụ n'akara 31.8. Anyị jụru dibia Bekee bụ Ikenna Onoh onye bụkwa ọkammụta n'ihe gbasara ahụike ọha nke bekee kpọrọ 'public health'. Ọ kọwara na ọtụtụ ihe na ebute ọnwụ nwa amụrụ ọhụrụ kama ọ nwere nke gọomentị kwesịri ime. Onoh kwuru na gọmentị kwesịrị ime ka ụlọọgwụ ruo mmadụ niile aka, ọkachasa ndị bi n'ime obodo na ogbe nkịrika ụlọ. O kwukwara na ọ dịịrị gọọmenti ịgbasa ozi ma kuziere ụmụnwanyi di ime na ndị mụrụ ụmu ọhụrụ etu ha ga-esi ledo ụmụ ha anya. Nke a bụ afọ ole a na-atụanya na mmadụ nwere ike ibi ndụ n'obodo ọbụla site na nwata tupu onye ahụ anwụọ. Naijiria gbakwara onye nke ikpeazụ na nnyocha ndị WHO mere n'afọ 2016. Ikenna Onoh ji ihe mberede okporoụzo were maa atụ dịka okporo ụzo ọjụọ sọ n'ihe na-ebute ọnwụ erughi eru na Naịjirịa. Onoh kọwara na mgbe ihe mberede okporo ụzo mere, onweghi ndị gbatagbata nke goomenti ga-abia nyere ndị ihe mberede ahụ metụtara aka. O kwukwara na gọọmenti kwesịri itinye ụchụ n'ịkuziri ndi mmadụ maka ahụike ma rụkwaa ụlọọgwụ ebe ndị mmadụ ga-anata ọgwụgwọ ọr��a maọbụ nnyocha ahụ. N'ime mba asaa ndị ha na Naịjirịa bụ ọgbọ, Naịjirịa gbara onye nke atọ na ụgwọ opekatampe. N'ọdịnsoa ka e buliri ụgwọọnwa opekatampe na Naịjirịa ruo puku naịra iri atọ nke pụtara $83.10 ma a tụgharịa ya. Gabon gbara onye nke abụọ n'onụ $249.27 ebe Mauritania gbara onye nke mbụ n'ụgwo $801.26 opekete mpe. Mali gbara onye nke ikpeazụ n'ụgwo $47.29 ụgwo opekete mpe. A bịa na nrụrụaka, Naijiria na Mọritenịa bụ ndị nke ikpeazụ n'ime mba asaa ndị a bụ ọgbọ. Nke a bụ dịka ngalaba na-ahụ maka ịkwụba aka ọtọ bụ 'Transparency International' si depụta. Ha nyere Naịjirịa na Mọritenia akara 27/100. N'ụwa niile, mba abụọ a gbara ndị nke 144 n'ime mba 180 ngalaba ahụ nyochara. Senigal ji akara 45/100 bụru onye nke iri isi na asaa n'ime mba 180 ndị 'Transparency' nyochara. Kedu ihe bụ Nsogbụ Naịjirịa Ọ bụ Okoro etoghị eto wara ọgọdọ na-enye Naijirịa nsogbu? Anyị jụrụ Mazi Samuel Ohuabunwa ihe kpatara o ji dị ka Naịjirịa a na-alaghachi azụ. O kwuru na-enweghị ihe afọ olee Naijirịa dị nwere ime maka mmepe obodo. Ohuabunwa kwuru na Naijirịa na-emebu nke ọma oge a na-eme ọchịchị onye hazie akụ ya nke Bekee kpọrọ 'Regional Government'. Ọbụ mgbe ndịagha batara n'ọchịchị ka ihe niile ghasara. Na mpịachi, Ohuabunwa kwuru na ọ bụ ajọ ọchịchị na ajọ ndị ọchịchi mere na Naijirịa etobeghị. Ọ kọwara na Naijirịa nwee ezigbo ndị ọchịchị, na ha ga-etokwute mba ndị ọzọ na eme ọfụma. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49905476 +sports Isaac Chinagorom: Etu m siri turu ugo n'asọmpi egwu 'Malibu World Dancing Championship' na 1984 Isaac Chinagorom bụ ọgbaegwu riteere Naịjirịa nturu ugo n'asọmpi mbaụwa e mere na London n'afọ 1984. Ihe a kpọrọ asọmpi a bụ 'Malibu World Dancing Championship'. Dịka Mazi Isaac Chinagorom siri kọọrọ BBC Igbo, ọ bụ Muhammadu Buhari bụ ọchịagha na-achị Naịjirịa n'oge ọ gara asọmpi ahụ. O kwuru na Buhari kwere ya nkwa na ọ gaa turu ugo lọta, na gọọmentị ga-enye ya ụlọ iji jaa ya mma. Ọ gara ya bụ asọmpi ma gbaa onye nke atọ n'ime mmadụ iri isii (60). Mana oteghị aka ọ lọtara, a chụpụ Buhari n'ọkwa ọchịagha. Ugbua Buhari bụụr onyeisiala Naịjirịa ọzọ, Isaac Chinagorom na-arịọ ka o mezuo nkwa ahụ o kwere ya, afọ iri atọ na asaa gara aga. Onye mere akụkọ a bụ Chiemela Mgbeahuru. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58043818 +entertainment Pericoma Okoye: Ihe mere odogwu Izuọgụ ji anyị ajọ arọ "Na nsonso a, aha otiegwu Ichie Pericoma Azubuike Okoye, bidoro ịkpọtụ akpọtụ na soshal midia. Onye metere agụ Afrịka nọ n'ụra kemgbe afọ 2017 oge ọ lara mmụọ? Ọ bụ otu ụkọchụkwụ Chukwuemeka Ohanaemere ama ama dịka 'Odumeje' nke Mountain of Holy Ghost Intervention Deliverance Ministry dị n'Ọnicha, Anambara steeti. Odumeje 'kwuru okwu ọjọọ maka odogwu Izuọgụ n'ihe onyonyo fegharịrị n'ịntanetị na nsonso a nke butere ụka. Ụfọdụ ji ihe onyonyo ahụ nke kọkwara ndị Arọndịizuọgụ ọnụ ịbụ ogbenye, mere ihe ọchị. Mana ya bụ okwu akụkụ atọghị ndị Arọndiizuọgụ na ndị ihe Pericoma na-amasị gụnyere ọkpara Pericoma Okoye bụ Omor Perry na onye bụbu onyeisi Massob bụ Ralph Uwazuruike, ọchị. Uwazuruike, onye katọrọ ihe Odumeje kwuru sị na ""o wutere m na ala Igbo anaghị eji onye nwụrụ anwụ eme mkparị."" Omor Perry na onwe ya mara Odumeje aka sị ya pụta ka ha nwalee ike ka ike. Mana dịka a na-eme tụmsara n'okwu ahụ, ndị ọgba ọhụrụ na-ajụ onye bụdị Pericoma Okoye? Kedụ onye bụ Pericoma a na-ewu? Pericoma Okoye bụ otiegwu Igbo ama ama n'Ala Igbo egwu ya wuru ewu n' agbata 80s na 90s. Ọ bụrụ na ị na-anụ egwu ogene na udu a kpọrọ ""Omenana na-ese okwu"" na-eche onye tiri ya, mara na ị mara Pericoma site n'egwu ya. Egwu ndị ọzọ o tiri gụnyere; ""Ọgbaaghara"" (1990);""High Tension""; ""Ọ ga-atakụta ya aja"", ""Izu ka mma na nne ji""; Ị ghara Omenana mewe omenaelu"". Egwu ya bụ egwu na-ejupụta n'ilu, ịnya isi na okwu miri emi. Iji maa atụ, ""Onye sị na ọ bụrụ ya, ọ bụrụ ya o mee gịnị?""; Ọ bịara egbu anyị, je egbu onwe ya""; Nne ewu tawa ahụ, akịrịka na mma atụ ya ọgụ"" Ọ na-ejikwa egwu ya etu ndị ọgaranya Igbo aha. Onye Arondizuogu dị n'okpuru ọchịchị Ideatọ, Imo steeti, Pericoma bụ onye mmasị ya n'ọdịnala Igbo ka ewu ewu karịdịa egwu ya. A ma ya dịka 'Mezuo Mbụ nke Arọndizuogu' maka nke a. Iji kọwaa nke a, Nwaeze Onyekaba Emmanuel Odenigbo sị na, ""Pericoma bụ nnukwu arụsị dị na ụdị mmadụ."" Odenigbo, onye ji Bob Marley tụnyere Pericoma n'iti egwu sị na ọ bụ otiegwu Chineke nyere ike pụrụ iche. ""Chineke ya nyere ya ike, o jikwa ya akpakwa ike."" O kwukwara na Pericoma bụ ""ọgbaọgụ nwanne."" ""I nwee mmekpa ahụ n'ebe ị na-azụ ahịa bịa kpesara ya, ọ ga esoro gị gaa lụọ ọgụ ahụ."" Ọtụtụ ndị mmadụ maara Pericoma bụ onye a mụrụ n'afọ 1948 ""Arụsị Makaja Mbụ nke Arondiizuọgụ."" Ọtụtụ na-atụkwa ya egwu n'ihi akụkọ ihe arịbaama nakwa ihe miri emi odogwu a kpọrọ 'agụ nke Afrịka' na-eme. Nke kachasị wuo nke o jikwara gụọ egwu bụ akụkọ etu ndị ụtụisi si jide ya n'Upper Iweka n' Ọnicha. Akụkọ a dịka akụkọ ifo kwuru na ndị a bụ ndị amaghị na ọ bụ Pericoma buliri ya elu ka ha buru ya gawa n'ụlọọrụ ha mana aka ha tọrọ n'elu dịka ha enweghị ike ibutu ya. Ọ bụ oge ha wetara ọtụtụ ihe onyinye were medaa ya obi ka ha nwetara onwe ha. Mana ụfọdụ amaghị na nwaamadị a ahụ bụ onye ihe ejije. O soro mee ihe ejije Nollywood a kpọrọ ""Lion of Africa' nke ya na Pete Odochie soro mee. Na nkọwa ihe e ji echeta Pericoma, onye ọzọ si Arondizuọgụ bụ Charles Kanu sị na, "" Ọ na-eti mmọnwụ, ọ na-eri na mmọnwụ. "" Kanu gara n'ihu kwuo na ""a na-anụ aha ya dịka onye katara ahụ n'Arondizuogu na ala Igbo gbaa gburugburu."" ""O siri ike mmadụ. Ọ bụ nwa dịbịa e nweghị dịbịa ga-amali ya aka."" Mana o nwere mgbe a kọrọ akụkọ na Pericoma chegharịrị dịka o tiri egwu ụka, ""Ụnụ ekwela ka eduhie ụnụ "". Mana Odenigbo bụ onye ya na ya rụkọọ ọrụ egwu kọwara na ọ bụ ahịa ka ọ na-ere. "" 'Marketer' ya na ya na-arụkọ ọrụ gwara ya ka ọ kụo egwu ahụ iji ree ahịa."" Pericoma lụrụ ọtụtụ nwaanyị ma mụkwa ọtụtụ. Na agbanyeghị na ọ nwụrụ abalị iri na isii nke ọnwa Febụwarị afọ 2017, ụfọdụ ụmụ ya na-agbaso ụkpụrụ ya; Speed Darlington na Ebube Izuogu ( Prince Perry) na-eti egwu, ebe Omor Perry na Fenfe Pericoma Johnbosco nwere mmasị na ihe omenala. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-52572020 +entertainment New Yam Festival: Etu Ikeji Arochukwu nke afo a si kpọtụ Ndị Aro bi n'obodo dị iche iche bịara nara ike ha ga-eji rie ji ọhụrụ n'ebe ha bi. Ha gọrọ ọfọ, tee egwu, rie nri ma ñụọ mmanya maka afọ gara aga, ebe ha na-arịrọ chukwu maka afọ ọrụ ugbo ọhụrụ. Ndi ogo ọbụla na-ebupụta mmọnwụ ha. Ebe a ka ha na-arịọ chukwu ka ọ gọzie ha n'ụzọ ije ebe ọbụla ha nọ na-arụ ọrụ maọbụ azụ ahia. Ndị Aro bị n'ụzọ bịara were nzụ ha ji a lahachị azụ ebe ha bi. Iko maka okoko ndị kacha agba egwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-49783313 +entertainment 14th Headies: Ihe ị kwesiri ịma, oge, ebe na etu ị ga-esi kiri emume a "Emume Headies nke afọ 2020 ga-apụ nnukwu iche makana ndị mmadụ agaghị enwe ohere ha na ndị oti egwu na-amasị ha ịnọkọ n'ọgbọ emume ahụ. Nke a bụ mbụ udiri ọnọdụ a na-eme nakwa ọ ga-abụ n'elu intanet ka a ga-ekiri ya. Ndị hibere emume a na-agba mbọ ịhụ na ya bụ emume a ga-eme n'ụbọchị February 21, 2021 bụ nke ọtụtụ mmadụ kacha bịa site n'isonye n'intanet. Ọ bụ maka usoro mgbọchị mfesa ọrịa covid Lagos nakwa Naịjiria wepụtara kpatara nke a. Dịka ọ dị kamgbe afọ 2016, Ọ bụkwa n'Eko Convention Centre , ebe e nwere ụlọ oriri na nkwari ka ya bụ emume ka kpọtụ. N'afọ a , ndị na-eso ndị dịka Tems, Omah Lay, Oxlade nakwa Bella Shmurda ga na-atụ anya ka oti egwu ka masị ha bute mmeri ma mee ọtụtụ ihe iribama dịka ṅdị ọzọ riterela nturugo Headies si eme. Mana nturugo kachasịnụ bụ nke 'Artiste of di Year' nke o nwebeghị oti egwu ọbụla ritere ruo ugboro atọ. Wizkid na Davido enwetala ya ugboro abuọ ma na-elekwa anya inweta ya nke ugboro atọ mana ha na ndị dịka Burna Boy, Mayorkun nakwa Tiwa Savage ga-akwata na Headies nke afọ 2020. Headies 2018: Davido bụ onye kachasị turu ugo David Adedeji Adeleke, onye otiegwu a maara amara dịka,'Davido',bụ onye turu ugo ọkachasị n'iti egwu(artiste of the Year) na nnturuugo Headies mere n'abalị Satode. Egwu Davido a kpọrọ 'Fia' tukwara ugo dịka bụ egwu kachasị mma (Song of the Year), nakwa egwu kacha ewu(best pop song) N'okwu ya oge ọ na-anara nturugo ahụ, Davido kwuru na oge eruola ndị ụkwa ha kwusiri ike n'iti egwu inye ndị na-apụta apụta nkwalite na nka ha. Ọ sị,""oge eruola inyere ndị otiegwu ka na-apụta apụta aka"". Ndị ọzọ nwetara nntulugo bụ Simi,Wizkid,Omawunmi, Tiwa savage na ndị ọzọ. Simi pụtara dịka onye ọkachasị eti egwu n'ime ụmụnwanyị n'afọ 2018. Simi turu ugo onye nchịkọta egwu kachasị mma, onye egwu kachasị ụtọ abụ gbasara ihunaanya na onye ritere 'Best Recording' n'afọ 2018. Simi nupuru Tiwa Sava n'okwa nke a. Ma ọ tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n'anya na egwu Olamide na Phyno abaghị na ndị turu ugo na mmemme ahụ. Ụfọdụ nturu ugo Davido turu n'oge garaaga Davido enwela nzere ruru iri atọ. Ụfọdụ n'ime ha bụ onye okacha eti egwu BET, MTV Africa, Kora, Channel O na Headies. Ọ bụ egwu Davido tiri n'afọ 2011 ọ kpọrọ 'Dami Duro' bụ ihe mere ka ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa na mpaghara Afrịka marị ya ọfụma ọfụma. Ugbua Davido bụ onye ama ama na mba ụwa niile. Ụfọdụ n'ime egwu Davido bụ Fall (2010), If (2017), Aye (2015), The Sound (2015) na Biko (2016) na ọtụtụ ndị ọzọ. Akụkọ ga-amasị gị" https://www.bbc.com/igbo/media-44020922 +politics APC Candidacy: Andy Uba agbagharịala akwụkwọ n'Ụlọikpe Mkpegharị "Onye fere ọkọlọtọ otu APC na ntụliaka gọvanọ Anambra steeti n'afọ 2021 bụ Senetọ Andy Uba agbagharịala akwụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị. Uba na-agbagha mkpebi ụlọikpe nke kwuru na ọ bụghị ya bụ onye nwetara ikike ife ọkọlọtọ APC na ntuliaka e mere na nsonso n'Anambara steeti. N'akwụkwọ nke ọ gbagharịrị n'Ụlọikpe Mkpegharị dị n'Abuja nke bu akara :FHC/ABJ/CS/648/2021 Uba gbadọrọ ụkwụ n'ihe asatọ nke gụnyere; na ụlọikpe kpeburu ikpe ahụ enweghị ikike ịnụ ikpe ahụ nke ihe butere ya mere n'Anambara steeti. ""E mere ntuliaka imeụlọ n'Anambara steeti, ndị soro zọọ ya nọ maọbụ nwee mgbọrọgwụ n'Anambra steeti."" ""E nwere Ụlọikpe Ukwu Etiti n'Anambara Steeti ebe ihe butere okwu mere mana onye wetara ikpe ebugaghị ya ebe ahụ."" Ọkaikpe Inyang Ekwo nke Ụlọikpe Ukwu nke dị n'Abuja akagbuola nsonye Sinetọ Andy Uba na ntuliaka e mere n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba e ji họpụta gọvanọ Anambara Steeti. N'ikpe o kpere n'ụbọchị Mọnde, ọkaikpe a sị na onweghị oge Sinetọ Uba ritere ohere iji ọkọrọtọ patị All Progressive Congress n'ụzọ ziriezi. Ọkaikpe Ekwo kwukwara na onye tinyere akwụkwọ banyere ikpe a bụ George Moghalu gosiri na patị APC emeghị ntuliaka imeụlọ dịka ha siri kwesi. Ọkaikpe kwuru ka ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ nke Bekee kpọrọ ""Independent National Electoral Commission"" (INEC) hichapụ aha Uba n'akwụkwọ ha ji denye aha ndị so mee ntuliaka ahụ. Ha sịkwa ka patị APC nyeghachi maazị Moghalu nde narị iri abuọ na ụma ise o jiri kwuo na ya nwere mmasị iso zụọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati ahụ makana ha emeghi ntuliaka imeụlọ ziriezi. Otu a kpọrọ ""The Senator Andy Uba Governorship Organisation"" (SAUGCO) kwuru na ya na pati ya bụ APC ga-eje ụlọikpe were rịọ mkpegharị banyere mkpebi Ọkaikpe Ekwo. N'akwụkwọ ozi BBC Igbo hụrụ Osote Onyeisi ha n'ihe banyere mgbasaozi bụ Ikechukwu Emeka Onyia binyere aka, otu ahụ sị ka ndị na-akwado ha kwanyere iwu ọha ugwu n'oge a. Ha sịkwa na ha ""hụrụ etu ndi na-akwado pati All Progressives Grand Alliance"" (APGA) na-enwe aṅụrị maka mkpebi ụlọikpe a"", mana ha si na ọ bu ezi ihe na ọbụghị sọsọ ụlọikpe a dị. ""Anyị na-aga ime mkpesa n'ụlọ ikpe mkpesa.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-59730421 +business Anyị chọrọ ka gọọmenti mee Airpeace ụgbọelu Naijiria- Osote Onyeisi Ụl Osote Onyeisi Ụlọomeiwu Anambara steeti kọwara BBC ihe mere ha jị chọọ ka gọọmenti mee Airpeace ụgbọelu ala Naijiria. https://www.bbc.com/igbo/afirika-49777579 +entertainment AMAA 2019: Ọgọdọ ụmụnwaanyị sụ wuchie n'AMAA 2019 "Ọ bụghị naanị akụkọ ndị meriri n'emume Africa Movie Academy Awards (AMAA) e mere n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Ọktoba pụtara. Ụmụnwaanyị bịara ya bụ emume sụụ ọgọdọ mere ka ndị mmadụ kpụrụ ha n'ọnụ ruo agwụ agwụ. Lekwa ụfọdụ n'ime ha na ọgọdọ ha sụ: Belinda Effah Ebe Belinda Effah bụ onye ihe nkiri ritere nturuugo AMAA n'afọ 2012 wuchiri n'emume ahụ n'uwe nke ya na-acha ọbara ọbara. Hilda Dokubo Uwe Hilda Dokubo suu bịa emume a mere ya ka ọ dịka nwa agbọghọ a ka na-achọ ịlụta ọhụrụ. Ihuoma Ejiofor-Suleiman Ihuoma Ejiofor onye ritere nturugo a n'afọ 2013 agbajọghị ndị nso nso ya agbanyeghị na ọ ka lụchara di nso nso a. Esther Agunbiade Esther nke Big Brother Naịja emepụrụ na nso nso a sụ uwe mere ka ndị mmadụ kpọwa ya ose na-acha anụnụ anụnụ. Sola Shobowale Lekwanu Sola Shobowale ka ọ dị ka nwa sisi a ka na-akpa nganga. Etu nwaanyị a si eme ihe nkiri nke ya na-enyekarị ndị mmadụ ọṅụ pụrụiche. O nwekwara ike ịbụ ya kpatara o ji nwete nturuugo ọkachaibe dịka onye nkiri mekarịchara ọfụma na ihe nkiri ""King of Boys"". Afọ 2019 ga-eme ya afọ iri na ise a na-eme ya bụ emume." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50198706 +sports Mikel Arteta: Anyị chere na ọbịbịa Mikel ga-ewetarala Arsenal ihe ọma Kelechi Anyikude amaama ka onye Igbo bi Ingland na-akwado Asernal sị na ọbịbịa Mikel Arteta bụrụ Arsenal ihe ọma maka ihe ọhụrụ ọ ga-ewetere Arsenal. Mikel Arteta abụrụla onye nkuzi ndị otu egwu bọọlụ Arsenal taa bụ Fraidee, abalị iri abụọ nke ọnwa Disemba afọ a. Ọtụtụ na-ekwu na Arteta nwere ike ịbụ onye nzọpụta Arsenal na-atụ anya ya. Arteta gbabuuru Arsenal bọọlụ tupu ọ laa ezumike nka. Ọ ga-esonye na nzọụkwụ Ole Gunnar Solksjaer na Frank Lampard bụ ndị gbabuuru Manchester United na Chelsea bọọlụ ma bụrụzie ndị nkuzi ha ugbua. Mana nke a abụghị naanị ihe gbara ọkpụrụkpụ maka nwa amadị a. Ihe iri dịmkpa gbasara Mikel Arteta Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50863729 +politics Inec Anambra Governorship List 2021: Lee kpọmkwem ndị niile INEC kwuru ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti "Ngalaba na-ahazị ntuliaka na Naịjiria bụ 'Independent National Electoral Commission' eweputela aha mmadụ iri na asatọ ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti. Cheta na ọ bụ n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ka ntuliaka a ga-adị. INEC wepụtara aha ndị a na mgbede taa bụ Tọzde, abalị asaa nke ọnwa Ọkụtoba. Ka ọ dị ugbua, ọ fọla naanị abali iri atọ na isii tupu ụbọchị ya bụ ntuliaka eruo. Lee aha ndị ha wepụtara nakwa otu ndọrọndọrọ ọchịchị ha nọ na ya: Ngalaba 'Independent National Electoral Commission' ewepụtela aha ndị ga-eso zọọ ọkwa Gọvanọ n'Anambra Steeti. Mana ihe gbara gharịị bụ na aha Chukwuma Soludo nakwa nke Valentine Ozigbo adịghị n'akwụkwọ nke Inec wepụtara. Chukwuma Soludo bụ onye meriri ntuliaka imeụlọ nke pati APGA, ebe Valentine Ozigbo meriri nke PDP Ọ bụ n'ehihie Fraịde ka Inec wepụtara akwụkwọ aha ndị ga-eso zọọ ọchịchị n'Anambra steeti. N'ime akwụkwọ ahụ, aha mmadụ iri atọ na isii dị n'ime ya, nke gụnyere mmadụ iri na asatọ na-azọ ọkwa gọvanọ nakwa mmadụ iri na asatọ bụ osote ha. A bịa na pati APC, onye aha ya dị ebe ahụ bụ Emmanuel Andy Nnamdi Uba, ebe osote ya bụ Johnbosco Okechukwu Anaedobe. Mana na Pati APGA, onye aha ya dị ebe ahụ bụ Chukwuma Michael Umeoji, ebe osote ya bụ Orogbu Obiageli Lilian. Na nke PDP, onweghị aha ọbụla e dere ebe aụ, kama ihe Inec dere bụ ""court order"". Na YPP, onye aha ya dị ebe ahụ bụ Ifeanyi Uba, ebe osote ya Aloysius Izuchukwu Ekee. Cheta na ndị PDP n'Anambra steeti kewara ụzọ abụọ n'ihi na ha na-azọ onye ga-abụ onyeisioche. Mmadụ abụọ na-azọ ya bụ okwa nwechara akwụkwọ si n'ụlọikpe nke na-ekwu na ọ bụ ha bụ onyeisi n'otu n'otu. Nke a mere ka ndị isi PDP n'Abujakposaa ọchịchị PDP nke Anambra, ọ ga-enye ha nsogbu na ntuliaka 'Primary' ha?ma jiri aka ha họpụta ndị ga-ahazi ntulaiaka imeụlọ na steeti ahụ. Mana nke a mere ka otu PDP abụọ ahụ nọ n'Anambra mee ntuliaka imeụlọ icheiche, ma họpụta ndị ha kwuru meriri. Otu nke mbụ họpụtara Valentine Ozigbo, ebe otu nke abụọ họpụtara Ugochukwu Uba. Mana ugbua, Inec ekwuola na onweghị onye n'ime mmadụ abụọ a ha kwenyere na ya, n'ihi na ya bụ okwu ka dịn'ụlọikpe. N'otu aka ahụ kwa, pati APGA kewakwara ụzọ abụọ n'Anambra steeti n'ihi esemokwu imeụlọ. Mmadụ abụọ na-azọ ọkwa onyeisi oche na pati ahụ: ha bụ Victor Ike Oye na Jude Okeke. Chukwuma Soludo nọ n'otu nke Victor Oye ebe Chukwuma Uneoji - onye nke Inec nabatara - nọ n'otu nke Jude Okeke. BBC Igbo kpọtụụrụ Chukwuma Soludo mana o kwuru na ya achọbeghị ikwu ihe ọbụla ugbua. Nsogbu malitere n'APGA n'afọ 2016 oge ụfọdụ ndị otu ahụ kwuru na ha achọzighị Victor Oye dịka onyeisi ha. Ndị a gara n'ihu họpụta nwoke a kpọrọ Nwabueze Okafor ka ọ bụrụ onyeisi ha. Mana o teghị aka, Okafor anwụọ; ha wee họpụta Martin Agbaso ka ọ nọchie anya ya. Kamgbe ahụ, okwu onye bụ onyeisioche APGA n'Anambra steeti akọbeghị ụkọ n'ụlọ ikpe. Bido na 2016 ruo taa, Ndị kwurula na ha bụ ndị isi APGA gụnyere: Victor Oye, Martin Agbaso, Edozie Njoku, na Jude Okeke. Mana dịka o si dị ugbua, INEC egosila na ọ bụ Jude Okeke ka ha ma dịka onyeisi Apga." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57842787 +politics Nnamdi Kanu Re-arrested: Akwụkwọ njem Kanu ka dị na mba Kenya - Aloy Ejimakor "Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu onyeisi otu Ipob anwụchiri bụ Nnamdi Kanu ekwuola na n'ezie akwụkwọ njem ya bụ 'Passport' na Bekee dị na mba Kenya. Ọ gwara BBC n'ekwentị na akụkọ nyocha nke ụlọ ntaakụkọ Guardian dị na mba Briten mere were chọpụta ihe a bụ nke ezi ya. Ọ sị na ""ọ pụtala ihe na Nnamdi Kanu bụ onye Naịjirịa ma nwee 'Passport' nke mba UK. ""E mekwere m ka amata nke a mgbe m degaaara onyeisi ụlọ nnọchiteanya nke mba UK dị na Naịjirịa ozi edemede maka nwụchi Kanu"" ka o kwuru. Ejimakor kọwara na mba Kenya dara iwu jikọrọ mmekọ mba na mba n'ịkpọrọ Nnamdi Kanu akpọnye gọọmentị Naịjirịa. Iwu a bụ iwu pụrụiche akpọrọ 'Rendition' bụ mgbe otu mba nwụchiri onye is mba ọzọ n'ụzọ ezighi ezi. O kwuru na iwu ahụ malitere na 'Geneva Convention' nyere ka akpọghachi onye ọbụla nwere mba abụọ dịka Kanu na mba ebe o bi. Cheta na gọọmentị mba Kenya ka na-agọpụ na aka ha adịghị na nwụchi na mkpọlata Nnamdi Kanu e mere n'ọnwa Juun. Ebe gọọmentị mba Briten nke gụnyere Lord Alton bụ onye omeiwu na-ajụ ajụjụ gbasara ebe ya bụ ihe si mee. Ọnụ na-ekwuru otu Indigenous People of Biafra bụ Emma Powerful kwuru na obi adịghị ha mma etu gọọmenti ndị Kenya na-agọ na aka ha adịghị na nwụchị O kwuru na ha na-agwa ndị otu Ipob nakwa ""ụmụnne anyị"" niile nọ ebe ọbụla ha nọ ha abazila ụgbọelụ ndị Kenya ọbụla"" N'ọnụ ya, ""onye ọbụla bụ onye Biafra maọbụ onye Igbo nọ ebe ọbụla, ịhụ ihe ọbụla gbasara ndị Kenya, wepụ aka, egola ya, akwadola ya."" Powerful kwuru na ọ bụ onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu gwara ndị otu Ipob na ọ bụ gọọmenti Kenya na gọọmenti Naịjirịa jịkọtara nwụchie Kanu. N'ọnụ ya , ọ bụrụ na ndị bi na Kenya kwuo na ha amaghị maka etu e si nwụchị Kanu, ha mee ngaghagharị iwe gakwuru gọọmenti ha, nke ga-eme ka eziokwu pụta ihe."" ""Uhuru Kenyatta bụ onyeisiala Kenya egosila na ọ bụ oyi egwu maka etu o si kwe ka anwụchie Nnamdi Kanu na mba ya."" Nnamdi Kanu bụ onye ndu anyị ka bụ onyeisi anyị agbanyeghị na-anwụchịrị ya."" Powerful kwuru na Kanu wepụtara atụmaatụ etu Ipob ga-esi gaa tupu anwụchie ya. ""Onye ọbụla na-ekwu na Ipob enwela maọbụ ga-enwe onyeisi ọhụrụ makana Kanu nọ n'ime , na-atụ ezigbo asị."" Cheta na mba Kenya gọrọ ukwụ na aka na ha adịghị n'ihe mere Nnamdi Kanu, ma sịkwa ka ndị sị n'aka ha dị ya wete akaebe. Powerful kwuru na otu Ipob chọrọ ka atọghapụ onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu. O kwukwara na ndị ọkaiwu Igbo nọ na London akpụkpụla gọọmenti etiti n'ụlọikpe International Criminal Court gbasara nwụchigharị Nnamdi Kanu. Cheta na onye ọkaiwu n'ekwuchitere Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor gwara BBC Igbo ụbọchị Satọde na ha na-ahazi etu dọkịta Nnamdi Kanu ga-ezute ya kwam kwam. Ọ kwuru na nke a bụ maka mmerụ ahụ nakwa obi ya ọ sị zara aza site n'ihe ọ gabigara n'oge a nwuchiri ya. Ọ si na ọ bụ site na nnyocha ndi dọkịta na Kenya mere ka e siri chọta na obi Kanu zara aza. Ọ sị n'ezia n'aka ndị uweoji mba Kenya dị na nnwuchi Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57714941 +politics Russia and Ukraine war: Ajụjụ na ọsịsa asaa ị maghị maka agha Russia na Ukraine "O meela abalị iri abụọ Russia wakporo Ukraine n'ihe ụwa kpọrọ agha kacha njọ a na-ebuso obodo kwụrụla onwe ya n'Europe kemgbe Agha Mbaụwa nke Abụọ. Kemgbe ya bụ agha malitere, ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ ọsịsa ajụjụ ihe ndị na-agba ha gharịị gbasara ihe mere mba abụọ bụ ndị agbataobi ji na-alụ agha. Lee ọsịsa ụfọdụ ajụjụ ndị ahụ ndị mmadụ na-ajụ: 1) Ọ bụ Russia nwebu Ukraine? N'ebe afọ 1772 ruo 1795, ọtụtụ mpaghara ndịda anyanwụ Ukraine dịbu n'okpuru Russian Empire, site n'oke Poland. N'afọ 1783, Russia wegharala mpaghara ndịda Ukraine site na mgbakwunye Crimean Khanate. Ukraine na-esote Russia dịka mba kacha buo ibu na mpaghara ọwụwa anyanwu nke Europe. Ukraine anọghịzị n'okpuru Russia, dịka Ukraine mara ọkwa nnwereonwe ha n'afọ 1918. N'afọ 1921, Ukraine kpọpụtara onwe ha dịka mba Ukrainian Soviet Socialist Republic, bụ nke ha hibere mgbe ndị agha Russia a kpọrọ Red Army, wakporo mpaghara abụọ n'ime atọ na mba Ukraine. Ha lụrụ agha ọtụtụ oge n'ụzọ dị iche iche, mana n'afọ 1991, Ukraine kwuputere nnwereonwe ha ka a nwachara iweghara ọchịchị n'ike na Moscow. 2) Kedụ mgbe Russia wakporo Ukraine? Ụwa tetara n'ụbọchị 24 nke ọnwa Febrụwarị afọ 2022 nụ na Russia awakpoola Ukraine, bụ ndị ha ji agha na-eyi egwu kemgbe afọ 2014. Mwakpo a bidoro mgbe Onyeisiala Vladimir Putin kwuru okwu n'ebe 02:55 GMT nke ụtụtụ ahụ, sị na ndị agha abanyela ọrụ na Donbas nke mpaghara ọwụwa anyanwụ Ukraine. Putin kwuru na Russia na-eme ya bụ mwakpo ""iji chekwaa onwe ya"", na Russia ebughi n'obi iwakpo Ukraine, mana ha ga-akụkpọ ndị agha ma mee ihe ọ kpọrọ ""de-nazify"" mba ahụ. 3) Ukraine na Russia a na-asụ otu asụsụ? Russia na Ukraine na-asụ asụsụ sitere n'ihe a kpọrọ ""slavic"", nke mere na o nwereike na-ada ka otu asụsụ na ntị onye na-abụghị onye mba abụọ ahụ. Ndị bi na mba abụọ a nwereike ịghọta ihe ha na-asụ, ganye na onye ahụ ebi nso okeala jikọrọ mba abụọ a, maọbụ biri nso ndị mba ahụ. N'agbanyeghi na a na-akpọpụta okwu ha n'ụzọ dị iche iche, asụsụ abụọ a nwere mkp��rụedemede na-adịghị na ha abụọ - nke Ukraine nwere (ґ, є, і, na ї) nke asụsụ Russian enweghi - ebe nke Russian nwere (ё, ъ, ы, э) na-adịghị n'asụsụ Ukraine. Ọmụmaatụ nke a dị n'etu e si asụpe isiobodo mba Ukraine - Russia na-asụpe ya ka Kiev, ebe Ukraine na-asụpe ya ka Kyiv. Ukraine na-asụ asụsụ Ukrainian ebe Russia na-asụ Russian. O nweghi ihe o mere ma mmadụ sụọ Russian na mba Ukraine. 4) Asụsụ Ukraine ọ ka yie asụsụ Polish ka ọ bụ Russian? Asụsụ Ukraine ka yie nke Polish karịa nke Russian 5) Gịnị ka a na-akpọbu Ukraine mbụ? Mba Ukraine na-azabu Ukrainian People's Republic. 6) Russia ọ dị n'Europe ka ọ bụ n'Asia? Russia bụ otu n'ime mba 44 nke United Nations kwuru dị n'Europe. Mana, e nwere mpaghara Russia gafetere Asia. Russia abụghị naanị mba Europe gafetekwara Asia, dịka Kazakhstan, Azerbaijan, Georgia, na Turkey sokwa nwee mpaghara ha dịkwa n'Europe. 7) Afọ ole ka Putin dị? Vladimir Vladimirovich Putin bụ onyeisiala mba Russia dị afọ 69 dịka a mụrụ ya n'ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba afọ 1952. Ọ bu ụzọ banye ọkwa onyeisiala mgbe o meriri ntuliaka n'afọ 2000 (ka ọ rụchara site n'afọ 1999 ruo 2000 dịka Praịm minista), wee chịa afọ asatọ (ruo 2008) tupu ọ rịtuo wee rụọ dịka Praịm minista site n'afọ 2008 ruo afọ 2012 ọ zọtara ọkwa onyeisiala ọzọ. Kemgbe ọ banyere dịka onyeisiala mba Russia nke ugboro abụọ ya, ọ nọọla n'oche ahụ kemgbe afọ 2012 ruo ugbua." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60591325 +politics Osinbajo sị na Buhari amaghị maka mkpụpụ akpụpụrụ Onnoghen ụlọikpe "Akụkọ ndị dị mkpa Osinbajo: Buhari amaghị maka ịkpụpụ Ọkaikpe ukwu Naijiria ụlọikpe Osote onyeisiala Naijiria ekwuola na obi adịghị ya mma maka agwa a kpasoro onye Ọkaikpe ukwu Naijira bụ Jọstịs Walter Onnoghen. Osibanjo onye kwuru nke a n'ọgbakọ ndị na-ede akụkọ n'igwe okwu intanet ụbọchị Wenezde kwukwara na onyeisiala Muhammadụ buhari amaghị maka ya were rue ụbọchị Satọde. Cheta na a kpụpụrụ Onnoghen n'ụlọikpe pụrụ iche nke a kpọ®ọ Code of Conduct Tribunal maka ebubo na ọ kọwapụtachaghị ka akụ ya ha kemgbe ọ bụrụ Ọkaikpe ukwu Naijiria. Ọnụ ahịa ihe na-ada n'ahịa agbalitela rue pasent 11.44 dịka nyocha nke ngalaba ọnụọgụgụ nke a kpọrọ National Bureau of Statistics wepụtara ụbọchị Wenezde maka ọnwa Disemba. Mgbalite a nke ji pasent 0.16 were karịa nke mere n'ọnwa Nọvemba kachasị ihe ọdịda ọnụ ahịa kemgbe ọnwa asaa gara aga. Mgbe ikpeazụ ihe dara ọnụ otu a bụ n'ọnwa Mee afọ 2018. Ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba bụ Uche Uwaleke kwuru na ọ bụghị ihe kwesiri ime ka ndị Naijiria tụọ uche. ""Ihe kpatara ihe jiri daa oke ọnụ bụ n'ihi na ọtụtụ mmadụ na-azụ ihe maka mmemme Ekeresimesi."" Ụwaleke kọwara n'ihe ndị ego ha gbagoro bụ ihe nrị dịka mmanya ọtọ bịrịbịrị, osikapa, ji, achịcha Bekee, azụ na ihe ndị ọzọ, ihe ndị bụcha ihe ndị mmadụ ji eme emume. Ụmụ Zimbabwe na-eme ngagharịiwe maka na a manyere ego n'mmanụ ụgbọala Onyeisiala mba Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa onye nọ njem na mba Rụssia akatọla ngagharịwe na mmebi ihe so ya dịka ndị obodo ya na-egosi iwe ha maka ego etinyere na mmanụ ụgbọala na mba ahụ. Ọ kwuru na ya na-ahazihari obodo ha iji dọta ndị jiego achụ ego, ọbụghị ọgbaghara na tigbu zọgbuo. N'egwuregwu, Roger Federer emeriela Dan Evans na asompi 'Australian Open' na-aga n'ihu ugbua. Federere ga-ezutezi Taylor Fritz n'agba nke atọ nke asompi ahụ. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-46895951 +politics Ihe Ipob sara ndị agha kwuru na ha wakporo ogige ndị ESN n'Ohafia "Emma Powerful, bụ ọnụ na-ekwuru ndị otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) ekwuola na ndị agha Naịjirịa anaghị ekwu eziokwu, dịka ha kwuru na ha wakporo ogige ndị IPOB na ESN dị n'Ohafia. N'ozi o ziteere BBC Igbo, Powerful kwuru na ha bụ ndị Ipob ekwuola ugboro ugboro na ha enweghị ogige ọbụla n'Ohafia. ""Ogige ndị ekperima niile ndị agha Naịjirịa na-asị na ha wakporo abụghị ogige ndị ESN. Ogige ndị ESN nwere ezi nchekwa ma bụrụkwa ebe dị asọ,"" Powerful dere. ""ESN anaghị atọrọ mmadụ maọbụ anapụ ndị aka ha dị ọcha ego. Ndị agha Naịjirịa kwesịrị ịkwụsị ebubo na aha ọjọọ ha na-akpọ ndị Ipob na ESN, aka anyị dị ọcha."" ""Aka ESN adịghị na ntọrọ onye agha n'Ebem Ohafia. Ndị agha ikwu na ha wakporo ogige ndị ESN dị n'Amangu iji gbapụta onye otu ha bụ Bassey Ikunugwan, bụ asị."" Cheta na ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa bụ Onyema Nwachukwu kwuru na ndịagha ha wakporo ogige ndị Ipob/ESN ma chọta ọtụtụ egbe na ngwaọgụ. Ndị agha Naịjirịa nke ngalaba 82 Division ak��ọla etu ha si wakpo ogige ebe ha sị na ndị ọgụ nnupuisi Indigenous People of Biafra na 'Eastern Security Network' ji mere ebe obibi. Onyema Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha, kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara na mgbede taa bụ Wenezde, ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba 2022. Nwachukwu kwuru na ndị ekperima a tọọrọ otu onye otu ha bụ Bassey Ikunugwan n'ụbọchị Wenezde, ụbọchị abụọ nke ọnwa Nọvemba, n'okporo ụzọ Okwu-Ebem Ohafia dị n'Abia steeti. N'echi ya bụ Tọzde (Nọvemba 3), ndị agha malitere ịchọ onye otu ha ahụ banye n'ime ọhịa dị n'obodo Amangu ebe ha na ndị ekperima ahụ kwara mgbọ, ha wee gbuo otu onye, ma nata ya otu egbe AK47, ọtụtụ mgbọegbe na otu ekwentị. Ka abalị abụọ gachara, ndị agha wakpokwara ọhịa ọzọ ebe ndị ekperima bikwa na mpaghara ahụ, gbagbuo ndị ekperima abụọ ebe ndị ọzọ bu mgbọegbe gbaa ọsọ. ""Ndị agha chọtara egbe AK47 abụọ, egbe 'pump action' anọ, otu egbe 'pistol', otu egbe 'sniper', ọtụtụ mgbọegbe na otu ọgbatumtum,"" Nwachukwu kwuru. Ihe ndị ọzọ ndị agha kwuru na ha hụrụ n'ogige ndị ekperima a gụnyere igwe osefoto CCTV abụọ, otu ekwentị walkie-talkie, ekwentị abụọ, akwụkwọ ukwe njirimara ndị Biafra abụọ, nnukwu mma, uwe ndị agha, otu igbe vootu ndị Inec, otu igwe ndị Inec ji edebanye aha n'akwụkwọ ntuliaka, na ihe ndị ọzọ. Nwachukwu gara n'ihu dọọ aka na ntị na ha agaghị agbachi nkịtị ka ndị ekperima na-awakpo ma na-atọrọ ndị agha. O kwuru na ha agaghị ege ntị na ndị asịrị na-akatọ ndị agha ma na-ebo ha ebubo iji aka ike akpaso ndị obodo agwa. ""Anyị na-agwa ndị obodo Amangu bụ ndị na-edebe iwu obodo ka ha ghara ịtụ ụjọ ọbụla n'ihi na ndị agha ga na-echekwa ha oge niile,"" Nwachukwu kwuru. Nke a abụghị nke mbụ maọbụ nke abụọ ndị agha na ndị ojiegbe na-atakọta isi na mpaghara Ohafia, Abia steeti. N'ọnwa Ọgọst, BBC Igbo dere akụkọ etu mwakpo ndị ojiegbe si taa isi ndịagha abụọ n'Ohafia. N'ụbọchị abụọ nke ọnwa Maachị afọ a, akụkọ pụtakwara maka etu ndị amaghị ndị ha bụ si wakpo Obodo Amangwu, gbuo ụfọdụ mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ. N'afọ 2020, n'ọnwa Eprel, ndị obodo Ohafia boro ebubo na ndị uweojii gburu otu nwa okorobịa aha ya bụ Fraiday Arunsi. Ọbụghị sọ n'Ohafia maọbụ n'Abia steeti ka ọnọdụ nchekwa jọrọ njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa; ọ dị otu a na steeti ise dị na mpaghara ahụ. Ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ọ bụ ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ Ipob n'ịchafụ, na ndị ọgụ ha bụ ESN, na-akpa ike ọjọọ niile a. Mana ndị Ipob na-agọ agọ na ọ bụghị ha. Onyeisi Ipob bụ Mazi Nnamdi Kanu nọ n'ụlọ mkpọrọ n'isi obodo Naịjirịa bụ Abuja, dịka gọọmentị na-ebo ya ebubo na ọ bụ onye na-eyi ndụ egwu. Ipob nke pụtara Indigenous People of Biafra bụ otu Nnamdi Kanu hiwere dịka ọ na-agba mbọ ịchọta nwereonwe Biafra. Ya bụ otu bụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ka otu kacha akpaike. Gọọmentị Naijirịa amchiela ya bụ otu ma kpọọ ya otu oyiegwu, ebe ndị Ipob na-ebo gọọmentị Naijirịa ebubo aka ike na ịkpa oke megide ndị Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa ebe ndị Igbo juputara. N'ọnwa Disemba afọ 2020, Nnamdi Kanu malitere otu ọrụ nche o kwuru ga-echekwa Ọwụwa Anyanwụ. Ọ kpọrọ ha 'Eastern Security Network'. Malite mgbe ahụ rue ugbua, tigbuo zogbuo rịrị elu n'a mpaghara Ọwụwa Anyanwụ. Ndị ojiegbe awakpola ọtụtụ ogige ndị uweojii ma gbaa ha ọkụ, gbukwaa ọtụtụ ndị uweojii na ndị Igbo nwere agba. Ndị ọrụ nchekwa nakwa Gọọmentị Naijiria eboola Ipob na ESN ebubo ịbụ ndị na-akpa arụ ndị a, mana ha agọọla ugboro ugboro na aka ha dị ọcha." https://www.bbc.com/igbo/articles/c514nl1nql2o +sports Liverpool vs Norwich City: Anwụrụla Norwich pịgbuo ka agbụsị Liverpool gosiri Norwich City ihe ha ji bụrụ ọkaibe na mba Yurope Norwich wetara onwe ha ihe mgbu site n'inye onwe ha goolu nkeji 7 site n'aka Grant Hanley. Nke a nyere Liverpool ikike ịgba ha ụjọ na-ahụ nke mere Mohamed Salah ji mezuoabụọ na nkeji 19. Norwich nwetere ohere ole na ole ime Liverpool ihe mana ha ejighi ohere a kpọrọ ihe. Liverpool dịka ndị ejighi ọchị malite asọmpi nke afọ a wụnyere ọgbụ goolu atọ site n'aka Virgil Van Dijk na nkeji 28. Tupu otu ọkara agwụcha na nkeji 42, Divock Origi mezuru ọkpụ anọ chara acha. Agbanyeghi etu ọnụọgụgụ goolu siri kwụrụ na agba nke mbụ, Norwich nyekwara ndị azụ Liverpool nsogbu n'agba nke abụọ ebe Emiliano Buendia kpịanyere Pukki bọọlụ ojiri dọkata otu ha ji chịa obele ọchị. Ọkacha gbaa - Divock Origi (Liverpool) https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49300303 +entertainment Don Jazzy Married: A lụrụ m nwaanyị mgbe m dị afọ 20, mana anyị gbasara oge m dị 22 Oti egwu Michael Collins Ajereh a ma dịka Don Jazzy ekwuputela etu o si lụọ nwaanyị mgbe ọ ka na-amalite okorobịa. Don Jazzy dị afọ 38 ugbua kọwara etu o si lụọ nwaanyị mgbe ọ dị naanị afọ 20, mana ha gbasara ka naanị afọ abụọ gachara. O wepụtara foto agbamakwụkwọ ya n'elu Instagram ya iji saa ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị ya gbasara mgbe ọ ga-alụ nwaanyị. O kwuru na ha malitere inwe okwu n'alụmdinanwunye ha maka na ọ bịara buru ihe gbasara iti egwu n'isi ya. O kwuru na ọ ka bukwu ihe gbasara mmepụta egwu ya n'isi, nke bụ na ọ na-atụ ụjọ na ọ ka nwere ike ịghasa alụmdinanwunye ọzọ ma ọ bụrụ na ọ lụọ nwaanyị ọzọ. O kwuru na ọ ga-eji nwayọ nwayọ na-eme ihe gbasara ime ọyị nakwa ịlụ nwaanyị. Omoissy kwuru na ọ bụ ihe ịtụ n'anya na Dbanj na Wande Coal ekwuputaghi maka ya n'agbanyeghi esemokwu ha nweburu butere mgbasa ha. Dayo Ashiru kwuru na enweghi onye Don Jazzy ji ụgwọ nkọwa ihe gbasara ndụ ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-56609973 +health Effects of Flooding:Otoro, akpịrịkpa na ọrịa ndị ọzọ nwere ike ịbakwute gị n'ihi oke idemmiri "Oke idemmiri wara n'ọtụtụ obodo na mpaghara dị icheiche na Naijria, taa isi ọtụtụ mmadụ ma mebie akụnaụba na ewumewu e ji akwalite obodo. Mana ị ma n'okwu ahụ ebeghị, ndị ọkachamara ahụike na-ekwu na dịka idemmiri ka dọ n'ọtụtụ ebe ugbua, o nwere ike ibute nsogbu ahụike dị icheiche gụnyere ọrịa na-esi na mmiri, ọrịa akpụkpọ ahụ nakwa ọrịa metụtara uche. Dịka Gọọmentị Etiti si gbaa n'ama, mmadụ 612 nwụrụ, ebe mmadụ dị 3,219,780 gbara ọsọ ndụ n'ihi oke idemmiri metụtara steeti 33. N' ịzụụka olemole gara aga, mmiri kpara mkpamkpa n'Okpuru Ọchịchị Ọgbaru, Ayamelum nakwa Anambra-East, Anambra-West dị na Anambra steeti weghara ọtụtụ obodo, ebe ndị mmadụ gbaghara ụlọ ha gbaa ọsọ ndụ. Lee ụfọdụ ọrịa ndị nwere ike izute gị ma ịkpachapụghị anya n'ihi oke idemmiri dịka Dkta na-ahụ maka ahụike ọha bụ Sivie Maduka nke ụlọọgwu 'University of Port-Harcourt Teaching Hospital' si kwuo: Afọ ọsịsa so na nsogbu idemmiri nwere ike ịkpalite n'ebe ọ wara. Dkta Maduka kwuru na idemmiri nwere ike ịba n'olulu nsị na mmamiri bupụta ihe dị n'ime ya bubaa n'ebe e si enweta ezigbo mmiri. Idemmiri tochie ebe niile, agaghị enwezi mmiri nke ọṅụṅụ maọbụ nke e ji esi nri. Dịka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ CDC si kọwaa, ọrịa kachasị apụta ma oke idemmiri mee bụ ọrịa afọ dịka ọnyụnyụ na ọgbụgbọ nke na-esi na ịṅụ mmiri adịghị ọcha. Otoro bụ ọrịa afọ ọsịsa nke nje a kpọrọ 'vibrio cholerae' na-ebute. Dịka Dkta Maduka siri kọwaa, “Otoro bụ ọrịa na-enye nnukwu nsogbu ya mere e ji agbasa ozi maka ya.” Otoro na afọ ọsịsa na-agbagwoju ọtụtụ ndị mmadụ anya n'ihi na ha amaghị nke bụ nke. Ihe dị iche na afọ ọsịsọ na otoro, dịka Dkta Madụka si kwuo, bụ na afọ ọsịsa bụ ""mmadụ ịnyụ nsị gbara mmiri karịa ugboro anọ maọbụ karịa, mana otoro bụ ọnyụnyụ nke ihe na-ebute ya bụ nje vibrio cholerae' nke nsị a na-anyụ na-adịka mmiri osikapa"". Mmiri ide metụ ahụ mmadụ maọbụ ọnya dị mmadụ n'ahụ, o nwere ike ibute nsogbu n'akpụkpọ ahụ gụnyere akịrịkpa na ọkọ. Oke idemmiri nwere ike ịchụpụta nsị na atịtị ndị ọzọ nke nwere ike ịbanye n'ikuku kpọọ nkụ, o nwere ike ibute ọrịa ọwara e ji eku ume, ọkachasị n'ụmụaka. Oke idemmiri nwereike ịchụpụta ọtụtụ anụmanụ na-ebi na mmiri gunyere ndị na-ata ata dịka azụ, agwọ na agụiyi n'elu ala. Dkta Maduka si kwuo, ""ajọ agwọ mmiri nwere ike ịta mmadụ bute nsogbu n'akwara maọbụ 'gangrene' n'akụkụ ahụ ebe ọ tara gị, ebe nsi maọbụ nje (fungi) ahụ nwere ike ịgbasa n'akụkụ ahụ ndị ọzọ."" 'Gangrene' bụ ọnwụ maọbụ mmebi akụkụ ahụ mmadụ n'ihe mmerụ ahụ maọbụ nje. Agụụ na-eso mwakpo idemmiri nke nwere ike ibute ọrịa marasmus, kwashiọkor nakwa ""malnutrition'. Dịka idemmiri wara, nsogbu agụụ na-awa ọtụtụ ndị bi na mpaghara ebe ọ wakporo agba. Mmiri mebiri ugbo ọtụtụ ndị mmadụ, ọtụtụ mmiri ka toro n'ụlọ ha nakwa okporoụzọ ha si aga ahịa maọbụ ọdọahịa. Idemmiri dọọ ogologo oge ọ na-enye ohere ka anwụta mụbaa nke nwere ike ibute ọrịa ịba. Dokita Maduka kwuru na mmadụ nwekwara ike bute ọrịa 'Hepatitis A'. 'Hepatitis A' bụ ọrịa na-eme ka umeju mmadụ zaa azaa (inflamation of the liver). A na-ebute ọrịa a site na mmiri maọbụ nri fọtọrọ afọtọ nke onye bu ọrịa ahụ metụrụ aka. Ọdachi idemmiri nwere ike ibutere mmadụ oke echiche, obi nkoropụ na mmụọ ida mba na ụdị ọrịa uche ndị ọzọ. Ndị ide mmiri wakporo nwere ike inwe nsogbu okpo n'ihi ịṅụ mmiri maọbụ iri nri okpo dị na ya. Dkta Maduka dụrụ ọdụ ka e nye ndị nwere nsogbu a ọkachasị ụmụaka ọgwụ okpo etu dọkịta siri nye ntuziaka." https://www.bbc.com/igbo/articles/c72dv0vwzgro +health Dengue fever, Malaria na ọrịa ndị anwụnta na-ebute nakwa etu ị ga-esi gbochie ọtịta ya "Ọtụtụ ndị na-akpọ ""anwụnta, anwụnta"", mana mmadụ ole ma na ọ bụghị naanị otu ụdịrị anwụnta dị? BBC Igbo chọrọ ịkọwara gị maka anwụnta, ọrịa ọ na-ebute na etu ị ga-esi gbochie ya. Ụbọchị 20 nke ọnwa Ọgọstụ kwa afọ ọbụla, bụ ụbọchị e kewapụtara maka icheta ụbọchị achọpụtara na ọ bụ anwụnta nke nwaanyị na-ebute ọrịa ịba. E nwere ọtụtụ anwụnta n'ụwa, karịrị nde, mana naanị ụfọdụ bụ ihe ndị mmadụ ma maka ya. Ọ dị ụzọ abụọ 1) Anopheles balabacensis na 2) Anopheles gambiae. Ọ bụ nke nwaanyị anwụnta Anopheles a na-ebute ọrịa ịba. Ịba bụ otu ọrịa anwụnta na-atanye mmadụ nke nwere ike igbu mmadụ. Ịba na-anyụkarị ndị mmadụ anya na mpaghara gụnyere Afrịka, Asia, ụfọdụ mpaghara Dominican republic na Haiti, Amerịkas nakwa Pacific Island. E nwere ọgwụ ụfọdụ e ji agwọ ọrịa ịba. Dengue bụ ọrịa anwụnta nke Aedes na-ebute, ọ na-efesa dịka nje mana ọ naghị esi na mmadụ fere na mmadụ. Ọ bụ ndị bi na mpaghara Asia, ụfọdụ mpaghara Afrịka, ụfọdụ mpaghara India, Amerịkas maọbụ Caribbean na-ebutekarị ya bụ ọrịa. Dịka e si chọpụta, ya bụ ọrịa anaghị emesikarị ike, ọ naghị anọfekarị otu izu tupu onye bu ya agbakee, mana ụfọdụ oge o nwere ike itinye ụfọdụ n'ihe ize ndụ na ndị ọ na-emesi ike. Enweghi ọgwụgwọ kpọmkwem a ma e ji agwọ ọrịa dengue, maọbụ ọgwụ mgbochi ya, ya mere e ji adụ ọdụ ka ị gbaa mbọ hụ na anwụnta ataghị gị ma ị gaa ebe ụdịrị ọrịa a dị. Nke a na-esikarị n'anwụnta a na-ahụ n'ụfọdụ mpaghara ụwa gụnyere Saụt na Sentral Amerịka, Carribean, Pacific islands, ụfọdụ mpaghara Afrịka na Asia. Ihe dị ka mba UK enweghi ụdịrị anwụnta ahụ na-atanye mmadụ ọrịa Zika. Ị nwere ike ibute ọrịa Zika ma anwụnta bu ya taa gị. A gụrụ gụrụ, mmadụ nwekwara ike isi n'aka onye nwe ọrịa a bute ya site n'akwamiko. O nwekwara ike isi na nne fere nwa nọ ya n'afọ ma nye nwa ahụ ọrịa ụbụrụ maọbụ mee ka isi nwa ahụ pee oke mpe nke a kpọrọ 'microcephaly' na Bekee. Ọ bụghị oge niile ka ọrịa Zika na-egosi n'ahụ onye bu ya. Ịba ọcha n'anya na-esi n'ụdịrị anwụnta a na-ahụ na mpaghara Afrịka, Saụt na Sentral Amerịka nakwa Trinidad dị na Caribbean. E nwere ọgwụ mgbochi a na-agba ma ọ bụrụ na ị na-aga ebe e nwere nje a. 1) Itinye neetị (akwa mgbochi): Ngalaba na-ahụ maka ahụike na mbaụwa a kpọrọ 'World Health Organisation - WHO' na-eke neetị aghara aghara iji nyere aka gbochie anwụ nta. Nke a so n'usoro e si achụ anwụnta na-anaghị eri oke ego, ma gharakwa imebi ihu igwe a kpọrọ 'ozone layer'. 2) Ịgba ọgwụ kemịkal: Nke a bụ usoro Bekee kpọrọ 'fumigation', nke bụ etu e si achụpụ ma gbuo ọtụtụ anwụnta site n'ịgba kemịkal ebe ha nọ. Nke a na-enye aka igbu anwụnta ndị na-anọ n'ime ọwara mmiri adịghị ọcha nakwa n'ime nkọrọ dị aṅa. 3) Na-eyichi ahụ: Yiri uwe na-ekpuchi aka na ụkwụ gị ma ọ bụrụ na ị nọrọ n'ogige ebe anwụnta na-ata. 4) Na-ete nchụ anwụ n'ahụ: Bekee na-akpọ ya 'insect repellent', ị nwere ike ite nke na-anaghị emebi ahụ ma na-achụkwa anwụnta, n'ahụ gị. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49392543 +health Menstrual hygiene: Ihe nwoke na nwaanyị kwesiri ịma maka nsọ ụmụnwaanyị Ụmụnwaanyị na ụmụnwoke, ndị na nna na ndị ọrụahụike nwere mkparịta ụka maka nsọ ụmụnwaanyị maka emume ncheta ụbọchị nsọ nwaanyi dịka United Nations si hibe. Dọkịta Chukwudi Ufondu, Florence Igboayaka, Adaora Okoro, Maazị Chidi na Oriakụ Onyinye Obimdike na Munachi Okereke nọ na ya bụ mkparịtaụka taa. Ihe ndị bụ ọkpụrụkpụ okwu sọ n'ihe ha kwuru. Gaazịa na ya bụ ihe onyonyo maka ihe ndị ọzọ: https://www.bbc.com/igbo/afirika-52839618 +politics Ibrahim Magu: Orji Kalu, na gọvanọ atọ si aka ya gaa nga Oge Ibrahim Magụ dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ 'Economic and Financial Crimes Commission' (EFCC) dịka ihe gaferela ka onyeisiala Muhammadu Buhari sị ka were ọsọ ọsọ laa ezumike nwa mgbe nta iji nye ohere ka e mee ya nnyocha ọfụma. Mohammed Umar arịala dịka onye nnọchite anya Magu. Nke a na-eme dịka a na-enyocha Magu maka ebubo nnupu isi na izuaghari akụnaụba a natara ndị mmadụ ikpe nrụrụaka mara. Ọ bụ n'ụbọchị Monde bụ ụbọchị isii nke ọnwa Juun ka Magu zara oku nnyocha Kọmiti onyeisiala hibere kpọrọ ya. Kemgbe ahụ ọ nọ n'aka ndụ ọrụ nchekwa. Okwu Magu dara ka dinta a na-achụ nta ya makana kemgbe onyeisiala Buhari were ya n'ọrụ dịka onyeisi EFCC n'afọ 2015 ọ bụ ya na-ahazi agha gọọmenti na-ebuso mpụ na nrụrụaka. N'ihu ọrụ a, ọ kpọchịrị ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ọkwa gbalitere ma tụọ ụfọdụ n'ime ha nga dịka ụlọikpe mara ha ikpe ohi ego ọha. Lee ụfọdụ ndị a gara nga site n'aka Magu: Orji Kalu gara nga ka ikpe mara ya banyere ebubo ohi ijere naịra 7.65 nke metụtakwara onye bu Kọmịshọna na-ahu maka ego oge ọ na-achị Abia steeti. N'ụbọchị ise nke ọnwa Decemba 2019 ka Ọkaikpe Mohammed Idris tụrụ Kalu nga afọ 12, mana Ụlọikpe Ukwu mechara tọghapụ ya. Kalu akpụpụla EFCC ụlọikpe ugbua maka okwu ahụ. Bala Ngilari bụbu aka na-achị Adamawa steeti. A tụrụ ya nga afọ ise maka ebubo nrụrụaka oge ọ na-achị dịka gọvanọ. EFCC boro ya na mmadụ abụọ ọzọ ebubo na ya nyere ndị mmadụ ohere ịrụ ọrụ ruru nde dọla 167 n'ụzọ na-ezighi ezi. Otu ụlọikpe dị na Yola mara gọvanọ ahụ ikpe ma tụọ ya nga afọ ise mana ụlọikpe mkpegharị kagburu mkpebi ahụ ma sịkwa na ebubo ahu enweghi isi na ọdụ. A tụrụ Jolly Nyame nga afọ 14 ka ikpe nrụrụaka banyere ego ọha mara ya. Ngalaba EFCC si na Nyame zuru ego ọha site n'afọ 1999 rue 2007 bụ oge ọ na-achị dịka gọvanọ. Ọkaikpe Adebukola Banjoko sị na EFCC, n'oge nke Magu, nwere akaebe kwụ ọtọ na Nyame mefuru ego ruru ijere dọla 1.6. Ụlọikpe Mkpesa na nke Ukwu sị na ikpe mbụ e kpere Nyame kwụ ọtọ. Nyame nọ na mkpọrọ ugbua n'ihi mkpebi ahụ. N'afọ 2007, EFCC boro Joshua Dariye, bụbụ aka na-achị Platu steeti ebubo na aka ya dị na nrụrụaka banyere izu nde naịra 121 n'akpa ego steeti ahụ. EFCC sị na ọ bụ site n'aka ụlọọrụ a kpọrọ 'Ebenezer Reitner Ventures' ka a kpara ike ahụ. Ha sịkwa na aha ụlọọrụ a adịghị n'akwụkwọ gọọmentị. Ka afọ iri gachara, Ọkaikpe Banjoko tụrụ ya nga afọ 16. Ụlọikpe Ukwu mechara wetuo afọ ole ọ ga-anọ site 16 ruo afọ iri. Ọ ka fọrọ Dariye afọ anọ ịnọcha na nga. https://www.bbc.com/igbo/afirika-53349841 +health 'Arụ na-eme n'ala Igbo bụ 'cancer' aga awapụ' - Asari Dokubo "Asari Dokubo bụ onye ama ama na agha nnupuisi na Naịjirịa kọwara otu ogbugbu mmadụ nakwa ọnọdụ enweghị nchekwa n'ala Igbo dịka akpụ ""cancer"" e kwesiri ịwapụ ozugbo ozugbo. Dokubo bụ onye kọwara onwe ya ka nwaafọ Igbo aha nnanna ya bụ Ediabalị katọrọ ajọ ihe niile na-eme na ala igbo na-ekwu na okenye ekwesighị ịnọ n'ụlọ ewu amụọ n'ọgbụ. Ọ kọtọrọ ndị niile nwere agba n'ala igbo maka ịgba nkịtị ajọ ihe dị otu a, bụ nke ọ na-ebo ndị otu Indigenous People of Biafra, Ipob, na-eme n'ala Igbo, maka egwu ha na-atụ. Asari sị ""anaghị m atụ onye obula egwu maka na ọnweghị ihe ha ga-eme m"". Ọ sị na ya ga-eso ndị ọrụ nchekwa hụ na-achụpụchara ndị ọjọọ na-egbu mmadụ n'ala Igbo. ""Ala Igbo bụ be anyị, anyị agaghị ahapụ ndị ajọọ mmadụ ka ha bịa were ọnọdụ"". O kwuru na ndị niile na eme ndị mmadụ agala ọrụ maka ""sit-at-home"" achọghị ọdị mma ndị Igbo. Asari sị na ihe abụọ e jiri mara Igbo bụ azụmahịa na ịga akwụkwọ, na ndị ajọ otu a anapụchaala ha ya. O kwuru na ọtụtụ mmadụ esichaal n'ala Igbo gbaa ọsọ maka enweghị nchekwa ebe ahụ. O kwukwara ndị ọzọ na-ere ụlọ ha na-agbapụ ọsọ ebe ha na azọ isi onwe ha. ""Unu a sị m ekwula okwu? agaghị ma akpa nkịtị mana ọ bụghị naanị ha ma achụ mmadụ"". Asari Dokubo sị na esemokwu ya na Nnamdi Kanu malitere ka e mechere ntuliaka ndorondoro ọchịchị n'Anambra na 2014. O kwuru na ya na ndị be Nnamdi Kanu akpaala kemgbe e jidechara ya. Ọ sị na ha rịọrọ ya ka ya aghara ịme ihe ọbụla ga-eme ka gọọmenti Naịjirịa ghara ịhapụ ya. ""Mana ndị otu Nnamdi kanu achọghị ịhapụ m aka. Ha na-akọtọ m. Mana ndị ahụ bịara rịọ m enweghị ike ijideli ha"". Asarị sị na ""ahụla m ihe n'ụwa. Abaala m n'ọnụ ọnwụ pụta maka na onwere ihe Chineke chọrọ ka m mee"". Ọ gbagwojuru ya anya ka ndị mmadụ si egbu ụmụnne ha maka ha na-achọ Bịafra. O kwuru na ọtụtụ ndị niile bụ ndị ọrụ nchekwa a ha na-egbu bụ ndị Igbo, ha abụghị ndị agbụrụ ọzọ. Dokubo bụ onyeisi ndị Biafra Defacto Government sị na ya na-ekwu uche ya n'okwu a, na ọ bụghị uche ndị Defacto Government. O kwuru na ọ bụ eziokwa na ndị Defacto Government achọghị ka ya na-ekwu ụdị ihe a mana ya agaghịzị agba nkịtị. Asari si na ya so gbaa mbọ ihu na ntuliaka Anambra gara were were. Ọtụtụ mmadụ anwụọla maka ọgbaghara na-ada n'ala Igbo kemgbe afọ abụọ ugbua. Gọọmentị Naịjirịa na-ebo ndị otu Ipob ebubo ibute ya bụ ọgbaaghara maka mnwereonwe ha na-azọ. Otu Ipob chọrọ ka ndi Igbo si na Naịjirịa pụọ mana Naịjirịa ekweghị. Ha kwenyere na a na-emegbu ha emegbu na Naịjrịa. Nke a abụghị mbụ nsogbu dapụtara maka ndị Igbo chọrọ ipụ na Naịjriịa. Asiri Dokubo sị na ya ekwegheghị otu Ipob si alụ ọgụ mnwereonwe. Ọ sị na ya na Nnamdị Kanu bụ onye ndu Ipob malitere ise okwu gbasa nke a kemgbe 2014. Ọnụ na-ekwuru otu Ipob bụ Emma Powerful, agwala BBC ugboro ugboro na ha emechiela ọnọdụ onye apụla ezi ha tinyeburu. O kwukwaala na aka ha adịghị n'oke ogbugbu mmadụ na-akpọtụ n'ala Igbo. Asari Dokubo bụ onyeisi otu Ijaw Youth Council ma bụrụ kwa onye bidoro Niger Delta People's Volunteer Force bụ otu ji ike ekwupụta ihe ha chọrọ n'aka gọọmentị. A mụrụ ya n'ọnwa Jun afọ 1964. Aha ya bụbu Melford Dokubo Goodhead nke ọbere kama ọ mechara tụgharịa aha ya were zawa Mujahid Dokubo-Asari mgbe ọ banyere okpukpere Alakụba. N'afọ 2013 ka Dokubo bụrụ onye mba Bene repụblịk ma were akụnụba ya gaa mba ahụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60177339 +sports Man City vs Wolves: Wolves akwụọla ụgwọ isi Man City dịka nwunye nke abụọ 'Ma nwata erughi eru wara ọgọdọ, ọgọdọ awụchie ya anya' bụ ihe Wolves mere Manchester City Wolves ji ọkpụ goolu abụọ chara acha tie Man City mmọnwụ n'ụlọ ha bụ 'Etihad Stadium'. Otu egwu bọọlụ abụọ ndị a siri ọnwụ na onweghi onye ga-enye ibe ha goolu ruo ngwụcha ọkara mbụ n'asọmpi a. Mana n'ime ọkara nke abụọ dịka ọ fọrọ nkeji iri ka e gbuchie bọọlụ, Wolves nyụrụ nsị n'ụlọ Man City site n'inye ha goolu. Goolu mbụ a Wolves nyere si n'aka Adama Traore na nkeji 80. Dịka Man City ka na-esi ọnwụ ịsa otu goolu a, Adama Traore wụchasịrị ha goolu ọzọ n'isi n'ime nkeji 90. Ọdịda a Manchester City dara ji ọnụọgụgụ asatọ dọlaa ha azụ n'ịchukwute Liverpool bụ ndị mbụ na tebụlụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49954269 +entertainment Madam Social: Mkpọnwụ ahụ m agaghị akwụsị m ịkpa ndị mmadụ ọchị "Madam Social dị afọ 80 na-ewu ewu ọfụma na soshal midia maka etu ya na nwa nwa ya si akpa ndị mmadụ ọchị. Mana akụkọ anyị nụrụ ugbua bụ na ọ nọ n'ezigbo ọrịa nke ụkwụ. Nwanwa ya nwoke a kpọrọ a ma dịka Mc Mcshade gwara BBC sị ""ọ bụ ule ọkpa na-eme ya ugbua"" ""Anyị mefuru ego ruru puku narị ise rue ugbua mana ọ ka na-arịa ya"" ka o kwuru. Cheta na Mama gwaburu BBC Igbo ihe mere o ji malite ịkpa ndị mmadụ ọchị na nka. Ọ sị na o ruru n'afọ 2019 mgbe ụmụ ya ndị nwoke abụọ nwụrụ na nke a gbawara obi mere o ji daa n'ọrịa mkpọnwụ ahụ bụ 'stroke'. Madam social sị na nke a mere o ji malite ịkpa ndị mmadụ ọchị iji chụọ ọbara mgbalielu na-agbanyeghi ọrịa ọ na-arịa. Kirie ihe o kwuru n'uju; Ndị mere akụkọ a: Ikechukwu Kalu Uzu na Nnamdi Agbanelo Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-56951096 +entertainment Big Brother Naija 2020: Onye ga-emeri n'afọ a? "Ajụjụ ọtụtụ ndị na-eso emume a na-eme n'ihe onyonyo bụ nke a kpọrọ Big Brother Naija Lockdown na-ajụ bụ ""onye ga-emeri nke afọ 2020""? Dịka a banyerela izu abụọ n'ime izu iri ha ga-anọ n'ime ụlọ Big Brother, ndị na-elele ya bụ emume enweela ndị ha na-akwado nakwa ndị ha achọghị iji anya ahụ. Ị chọọ Big Brother Naija Season 5 n'elu ịntanetị ugbua, a ga-agụta ihe ruru mmadụ asatọ maọbụ karịa bụ ndị a na-akpụkarị aha ha n'ọnụ n'ime mmadụ 20 nọ ya n'afọ a. Ndị a gụnyere Nengi, Laycon, Ozo, Dorathy, Erica, Kiddwaya, Prince, Wathoni, Ka3na, wdgz. Ọtụtụ ndị Big Brother na-amasị ekwuola na onye ga-emecha merie nke afọ a ga-esi n'ime mmadụ asatọ a pụta, ma ọ bụrụ na ihe niile gaa n'anya ya. A bịa n'ihe gbasara emume a, ọ bụ iwu na ọ bụ ndị na-ewu ewu na-emeri? N'afọ ndị gara aga, ọ bụ ndị kacha masị ndị na-elele ya n'onyonyo ha na-ekpebikarị (site n'ịtụnyere ha vootu) onye ga-emeri. N'ime Katung, Efe, Miracle, na Mercy meriri nke afọ ndị gara aga, ọ bụghị ha niile malitere n'izu nke mbụ ha nọ n'ime ụlọ wuwe ewu. Ndị dị ka Katung na Miracle mechara chakee dịka ụbọchị nọ na-aga, nke bụ na e nwekwara ike ọ gaghị abụ ndị nke na-ewu ugbua n'ụlọ Big Brother nke afọ 2020 ga-emecha merie. Mana nke afọ a, ọ bụ ndị na-elele tụnyechaa vootu, ndị n��� n'ime ụlọ Big Brother esi n'ime mmadụ anọ ndị otu ha vootu ha kacha pee mpe họrọ ndị ga-ala. Ndị ọbụla ndị otu ha kacha họrọ dịka onye ha chọrọ ka ọ laa, ka a ga-achụpụ n'ụlọ. Katung Aduwak: O meriri Big Brother Nigeria nke e mere n'afọ 2006 (nke mbụ a na-eme na Naịjirịa). Katung esoghidi ibe ya bata n'ụlọ n'isi mbido; o so na ndị batara ka a chụpụcharalarị mmadụ abụọ, mgbe izu atọ ya bụ emume malitere. Efe 'Efemoney' Ejeba Efe meriri Big Brother Naija nke a kpọrọ See Gobbe, nke e mere n'afọ 2017. Efe pụtara n'ọgbọ ebe a họpụtara ndị a ga-atụ vootu iji zọpụta, ugboro ise. Miracle 'Flyboy' Ikechukwu Igbokwe Ikechukwu meriri Big Brother nke e mere n'afọ 2018, nke a kpọrọ Double Wahala. Miracle kpara ike site n'imeri ọtụtụ egwuregwu na asọmpi ndị ha mere n'ụlọ ahụ, ndị gụnyere Payporte Arena Games, Final Wager nakwa Pepsi Refresh Your Mix. Ya na otu nwaanyị nọkwa n'ime ụlọ kwara iko ka ha ka nọ n'ime ụlọ, mana nke ahụ egbochighi ya imeri. Mercy 'Lamborghini' Eke Eke meriri Big Brother nke e mere n'afọ 2019, nke a kpọrọ Pepper Dem. Mmeri a mere Mercy na-akpọ onwe ya ""queen of highlights"" nwaanyị mbụ na-emeri emume a. Ọ bụghị naanị ịgbabi 'wire' n'egwu ka e ji mara mgbe ahụ, ihe ọzọ e jikwa mara ya bụ na ọ chọtara ịhụnanya ka ọ nọ n'ime ụlọ ahụ. Kedụ onye ga-emeri nke afọ a? Na nke afọ a, kepukepu na-ekwu na ụfọdụ ndị akwaala iko, ọtụtụ amịala ọnụ, mana ọ ga-enyere ha aka ka ọ ga-egbochi ha imeri? Kedụ onye i che ga-emeri nke afọ a? Gịnị ka ị chere mere ọ ga-eji merie?" https://www.bbc.com/igbo/afirika-53619748 +politics Alamieyeseigha, Dariye, Nyame, na ndị ọchịchị ndị ọzọ gọọmentị tọhapụrụ na mkpọrọ Joshua Dariye na Jolly Nyame abụrụla ndị nweere onwe ha n'ikpe nrụrụaka a mara ha. Nke a bụ maka na otu 'Council of State' nke Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ onyeisi ya, nyere ha mgbaghara n'ọgbakọ e nwere n'ụbọchị Tọzde, 14 Eprel, 2022. Mmadụ abụọ a, Dariye na Jolly, nọ na mkpọrọ n'ihi na ụlọikpe mara ha ikpe maka izu ego steeti ha. A tọhapụkwara mmadụ 157 ndị ọzọ, tinyere ndị agha e boro ebubo na ha so kpaa nkata ịkwatu ọchịchị gọọmentị. Mgbaghara a gọọmentị nyere ha pụtara na ehichaala mmehie ha niile, onweghịkwa ihe ọbụla iwu Naịjirịa gbochiri ha ime. Lee ndị ọchịchị ndị ọzọ nwetarala ụdị mgbaghara a n'aka gọọmentị: Diepreye Solomon Peter (DSP) Alamieyeseigha Alamieyeseigha rụrụ ọrụ dịka Gọvanọ Bayelsa Steeti malite na 1999 ruo afọ 2005. Achuturu ya n'ọkwa gọvanọ n'ihi okwu nrụrụaka. N'ọnwa Sepụtemba afọ 2005, e jichiri Alamieyeseigha na London maka izu ego ọha. N'oge ahụ, ndị uweojii UK hụrụ ego ruru otu nde paụnd n'ụlọ ya. Ha mechara chọpụta ego karịrị nde dọla atọ na ụma abụọ n'ọbaego ya, bịakwa chọpụta ụlọ anọ o nwere na London nke ego ya karịrị nde paụnd iri. Alamieyeseigha mechara gbaa ọsọ si na UK gbalata Naịjirịa. E mechara kpụpụ ya ụlọikpe na Naịjirịa ebe ọ nọrọ kweta na ikpe nrụrụaka mara ya n'afọ 2007, A tụrụ ya mkpọrọ afọ abụọ n'otu n'otu maka ebubo isii e boro ya. Alamieyeseigha anọrughị otu ụbọchị n'ụlọ mkpọrọ maka na e kwuru na ọ nọọla mkpọrọ ya oge ọ nọ n'aka ndị uweojii. N'afọ 2013, onyeisiala Goodluck Jonathan nyere Alamieyeseigha mgbaghara. Joshua Chibi Dariye Dariye chịrị Plateau Steeti bido na 1999 ruo 2007. N'afọ 2004, oge ọ ka bụ Gọvanọ, a nwụchiri Dariye na London ebe o bu nnukwu ego. Oge ọ chịchara rituo na 2007, ụlọọrụ EFCC kpụpụrụ Dariye ụlọikpe. Na 2011, Dariye meriri ntuliaka ịbụ Sịnetọ na-anọchite mpaghara 'Plateau Central'. Ọ bụ ọkwa ahụ ka o ji oge a mara ya ikpe ma tụọ ya mkpọrọ afọ iri na anọ. Mana Dariye mere mkpesa n'ụlọikpe kachasị, na-ekwu na ebubo e boro ya akwụghị ọtọ. Kama ụlọikpe ga-akụchapụ ikpe ahụ kpamkpam, ha buturu afọ mkpọrọ ya ka ọ bụrụzie afọ iri kama afọ iri na anọ. Mana n'ụbọchị 14 nke ọnwa Eprel, gọọmentị etiti nyere ya mgbaghara. Jolly Tavoro Nyame Jolly Nyame chịrị Taraba steeti malite na 1999 ruo 2007. Oge ọ rituchara n'ọchịchị, a kpụpụrụ ya ụlọikpe n'otu afọ 2007 ahụ ebe ọ nọ kweta na ọ manyere aka n'ụfọdụ ego gọọmentị. Ụlọikpe mara ya ikpe ma tụọ ya mkpọrọ afọ iri na anọ, mana ụlọikpe mkpesa mechara butuo ya ka ọ bụrụ afọ ise. N'ọnwa Febrụwarị afọ 2020, ụlọikpe kachasị kagburu mkpebi ahụ ụlọikpe mkpesa nyere, ma kwuo na Jolly Nyame ga-anọ afọ iri na abụọ na mkpọrọ. Nyame so na ndị Onyeisiala nyere mgbaghara n'ụbọchị 14 nke ọnwa Eprel 2022. Orji Uzor Kalu chịrị Abia steeti malite n'afọ 1999 ruo 2007. Ọ bụ eziokwu na gọọmentị enyeghị Kalu mgbaghara dịka e nyere ndị ọzọ e depụtara n'akụkọ a, kama o so na ndị a tụrụ mkpọrọ mechaa tọhapụ ya. E boro Kalu ebubo ma tụọ ya mkpọrọ afọ iri na abụọ n'afọ 2019 n'ihi nrụrụaka. Mana ụlọikpe kachasị mechara kagbuo mkpọrọ ahụ a tụrụ ya n'ihi na ha kwuru na ọkaikpe nyere mkpebi ahụ enweghị ikike ime ya. Oge ọ fọdụrụ obere oge ka o kpebie ikpe Kalu, Ọkaikpe Mohammed Idris nwetara mbuli elu si 'Federal High Court' gaa 'Court of Appeal'. Mana Idris natara ikike n'aka 'National Judicial Council' iji kpebie ikpe ahụ o ji n'aka tupu ọ gawa ebe ọhụrụ e zigara ya. Nke a mere Kalu ji wega mkpesa n'ụlọikpe kachasị na-ekwu na Ọkaikpe Idris enweghị ikike ịma ya ikpe. Ụlọikpe kachasị kwenyere nke a ma tọhapụ Kalu, nyezie iwu ka ebido ikpe ahụ n'isi. Akụkọ si n'ụlọọrụ Onyeisiala Buhari kwuru na ihe gọọmentị ji gbaghara mmadụ abụọ a bụ maka na ha agbagotela n'afọ, nakwa maka ahụike ha. Jolly Nyame dị afọ iri isii na isii ebe Joshua Dariye dị afọ iri isii na anọ. BBC Igbo enweghị ike ikwu etu ọnọdụ ahụike ha dị. Otu 'Council of State' bụ otu iwu Naịjirịa hibere maka ịdụ Onyeisiala ọdụ gbasara ọrụ dị mkpa dị icheiche. Ndị nọ n'otu a gụnyere: Onyeisiala, Osote ya, ndị niile chịburu Naịjirịa (ma ndị agha ma ndị nkịtị), ndị niile bụbu ndị isi ọkaikpe Naịjirịa, ndị isi ụlọ omeiwu ukwu na nke nta, ndị Gọvanọ niile, nakwa ọkaiwu gọọmentị etiti. Nwaeze Harry na nwunye ya, Meghan, agaala hụ Ezenwaanyị Briten ụbọchị Tọzde, nke mbụ ha n'ogologo oge. Dị na nwunye ahụ si mba Amerịka kwụsịrị na Windsor dịka ha na-akwado ịga The Hague dị na Netherland maka egwuregwu Invictus malitere n'abalị 16 rue 22 nke ọnwa Epril, a afọ 2020. Nwaeze Harry gaara Briten Ikpeazụ ya n'ọnwa Julai afọ 2021 mana nke a bụ mbụ ya n'afọ abụo Meghan na-aga ebe ahụ kemgbe afọ 2020 bụ oge ya na di ya hapụrụ Briten. Njem a ha mere gaa Briten na-abịa dịka Nwaeze Harry agaghị mmemme ncheta papa nnukwu ya bụ nke e mere na London n'ọnwa Maachị. Egwuregwu Invictus bụ egwuregwu Nwaeze Harry hiwere iji nyere ndị agha ochie merụrụ ahụ maọbụ daa ọrịa n'ụwa niile aka. https://www.bbc.com/igbo/afirika-61117354 +politics APC Presidential Primaries: Peter Obi ga-emecha chọpụta na ọ bụ ego ka e ji eme ndọrọndọrọ ọchịchị - Joe Igbokwe "Onye enyemaka Gọvọnọ Legọs Steeti na mkpocha na nzacha bụ Joe Igbokwe akọwala ya bụ ebubo ndị mmadụ na-ebo gbasara ije ego gara n'ọgbakọ APC ha jiri wepụta Bola Tinubu bụ onye ga-eburu ha ọkọlọtọ na ntuliaka onyeisiala nke 2023. Igbokwe, onye BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ sị na ego enyere ndị ""delegate"" na ntụlịaka imeụlọ ha mere abụghị ngarị, kama ihe ọ kpọrọ ""Logistic"", ""ka ọ ga-abụ akpọọ onye ahụ oku echi ọza gị"". Igbokwe sị na ịzọ ndọrọndọrọ abụghị egwu ụmụazị, na ọ bụ ego ka e ji eme ya. O kwuru na ego ndị ahụ bụ ihe e ji etinye ndị ahụ na họtelụ, nye ha nri na ihe ndị ọzọ. O kwuru na Peter Obi na-eme na ya anaghị enye ndị mmadụ ego ga-emecha chọpụta na "" a naghị agba aka ụkpọrọ ahụ nwata na-epu eze n'ọnụ."" O kwuru na mmadụ iri isii nọchitere anya ndị steeti Legọs na ya bụ ọgbakọ bụ ego ka e jiri kpọga ha ebe ahụ. Ọ zakwara ajụjụ maka ohere ndị Igbo nwere ịzọta ọkwa onyeisiala Naịjirịa, bụ nke o ji ilu kọwaa sị, ""ọkụkọ ga-abụ okeọkpa, a na-ama ya n'ụtụtụ"". Nke a pụtara na a na-amalite gboo kwadowe ịzọ ya bụ ọkwa. ""Ọ bụghị ihe a na-aba n'ike"". O kwuru na ndị Igbo e bidoghị n'oge kwadowe ya bụ njem, nke mere na ọ ga-ahịa ha ahụ inweta ya. O kwuru na uche Bola Tinubu adịla n'ọkwa onyeisiala Naịjirịa kemgbe 1990. Igbokwe sị na ndị Igbo agbajichaala akwammiri niile ha ruburu mbụ kaara ịnyere ha aka ịzọta ya bu ọkwa. Gee ya ntị n'ihe onyonyo a pụrụiche." https://www.bbc.com/igbo/articles/cn0477nxp66o +entertainment 'Etu m si malite ejije' - Zakky nke 'New Masquerade' "Tony Akposhere kọwara so na ndị a ma ama n’ime ejije na Naịjirịa. Na mkparịtaụka a pụrụ iche ya na BBC Igbo nwere, ọ kọrọ etu o si malite ọrụ ejije na nwata, tupu ọ nweta ọrụ n’ụlọọrụ mgbasaozi Nigeria Television Authority na Lagos. Ebe ahụ ka o si banye n’otu ejije ‘New Masquarade’, nke ya na Zebudaya na ndị ọzọ mere n'ime afọ 90. Akposhere bụ onye Uhrobo; obodo ya bụ Abraka dị na Delta steeti, mana ọ lụrụ nwaada Igbo aha ya bụ Ugochinyere Akposhere, onye Agbani, Enugwu steeti. Ha mụrụ ụmụnwaanyị ise nke ụfọdụ n’ime ha mụgoro ụmụ nke ha. Akposhere kwuru na ya malitere ịme ejiji site n'aka John Weyne, bụ onye na-egosi ha ejije ya mgbe ha pere mpe. Ọ sịkwa na ya malitere na 'National Museum Kitchen' bụ ebe a na-mere ha ejije mgbe ahụ site n'otu a kpọrọ Organisation for Young Artistes. Ọ sịkwa na akpọgara ha University of Ibadan bụ ebe a nọ kuziere ha ọrụ ejije. Ebe ahụ ka e si were ya n'ọrụ na NTA, malite ebe ahụ ka njem ọrụ ya malitere. O kwuru na ""ọ dị mkpa ka ụmụ ntorobịa mụta ọrụ ma tinye ụchụ ma mepụta ihe pụrụiche a ga-eji mara onye ahụ"". Mana o kwukwara na ""ndị ọgbara ọhụrụ n'ọrụ ejije na-akpasa ha oke"", mana ọ nwere ufọdụ n'ime ha na-elebere ha anya. Akpọshere kwuru na omume ndị ugbua na ndị ụnyaahụ abụghị otu. Ọ sị na ndị mgbeochie ka akwanye ugwu, mara ọrụ, ma na-asọpụrụ ọrụ ha." https://www.bbc.com/igbo/articles/ce7neyy987ro +health Ear infection: Tinnitus, Otitis externa na ọrịa ndị ọzọ nwereike inye ntị gị nsogbu Kedụ ihe ị ma maka ọrịa ndị na-enye maọbụ nwereike inye gị nsogbu na ntị? Ọrịa dị iche iche nwereike inye gị nsogbu na ntị, ụdị gụnyere ụda maọbụ mkpọtụ nakwa abụ ịpụta mmadụ na ntị so n'ihe ndị na-enye nsogbu na ntị. Ụfọdụ n'ime ọrịa ndị a nwere ngwọta ebe ụfọdụ bụ ọrịa tara nchara na-enweghi ọgwụgwọ. Ntị mmadụ nwere nke Bekee kpọrọ 'middle ear' nakwa 'inner ear'. Nke mbụ bụ ebe ụda na-esi n'udu ntị ('tympanum') agaru na n'ime ntị (inner ear). A bịa n'ọrịa ntị, nke kacha emetụta ndị mmadụ ọkachasị ndị okenye bụ nke a kpọrọ Tinnitus. Anyị ga-akọwa ihe ọrịa bụ. 1) Tinnitus: Nke a bụ ọrịa ntị nke mmadụ ga na-anụ ụda maọbụ mkpọtụ na ntị ya. O nwereike ime mmadụ n'otu ntị maọbụ na ha abụọ. Ụfọdụ oge ọ na-abụ oke mkpọtụ dịka nke si n'igwe okwu (loudspeaker), mmadụ imerụ ahụ n'isi, nakwa oke anya ajụ na-ebute ya. Marakwa na mkpọtụ ahụ ị na-anụ na ntị gị n'ihi tinnitus abụghị n'okirikiri gị ka o si abịa, ọ bụ n'ime ntị gị ka o si. Ụfọdụ oge ọ na-eji aka ya alara onwe ya, mana oge ndị ọzọ ọ ga-adị mma ka onye dọkịta ntị nyochaa gị. Etu ị ga-esi agwọ tinnitus: Ụlọọrụ ahụike NHS nke mba Briten nyere usoro a maka ilekọta tinnitus Obi amapụla gị na ị nwere tinnitus n'ihi na ọ bụghị oge niile ka o gosiri na ntị gị nọ n'ezigbo nsogbu ichi. 2) Otitis (media na externa): Ọrịa Otitis na-ebu ụzọ egosi onwe ya site n'oke mgbu na ntị nakwa ebe mmiri (fluid) juru na ntị. Nje (bakteria) kacha ebute ya bụ ndị nke a kpọrọ Streptococcus pneumoniae, Haemophilus influenzae, Moraxella catarrhalis, nakwa Streptococcus pyogenes. Nke a nwereike isi na nsogbu mkpọchi imi dịka rhinitis malite. N'ihi na e nwere okporo jikọrọ azụ imi na etiti ntị (middle ear) nke Bekee kpọrọ 'Eustachian tube', rhinitis nwereike ikpalite ọrịa a n'azụ imi ma ọ bụrụ na okporo a anaghị arụ ọrụ ọfụma, nke ga-eme ka mmiri tojuo n'etiti ntị n'azụ udu ntị. Ihe na-egosi na mmadụ nwere nsogbu n'etiti ntị ya: Etu e si agwọ ya: Ndị iche dị n'orịa Otitis media na Otitis externa: Ọrịa a bụ nke na-etinyekarị mmadụ n'ọnọdụ ebe ọ dị ya ka ụwa ya ọ na-eme ntụgharị. Ọ bụ nsogbu nke ime ntị (inner ear) na-eme ka isi ejuru mmadụ. A mabeghi ihe na-ebute ọrịa Meniere a, mana a ma na ọ bụ nsogbu mfachi ntị so eme ya. Ihe na-egosi ọrịa Meniere: Etu e si agwọ ọrịa Meniere: Ọrịa a enweghi ngwọta, mana dọkịta nwere ike inye gị ọgwụ ga-enyere gị aka maka anya ajụ na ịgbọ agbọ. Ọ bụrụ na ọ na-arịa gị, o gosi gị na ọ chọwala imalite dịka ibu gị anya ajụ na ihe ndị ọzọ, ndị dọkịta NHS na-ekwu na ọ ka mma na ị wegharịghị isi gị ọsịsọ, ma were nwayọ nwayọ na-aga ije, nọrọkwa maọbụ dinara ala ruo mgbe ọ kwụsịrị inye gị nsogbu. Nke a bụ ọrịa na-emetụta ọkpụkpụ 'mastoid' dị n'azụ ntị mmadụ. Ọ bụ ụmụaka ka ọ kacha emetụta. Ihe na-egosi na mmadụ nwere ọrịa a: Etu e si agwọ Mastoiditis: Ọrịa ndị ọzọ na-emetụta ntị mmadụ gụnyere: https://www.bbc.com/igbo/afirika-57138132 +entertainment Jason Njoku rịọrọ Ndigbo mgbaghara dịka ọtụtụ mmadụ nyere ụlọ ọrụ Iroko TV nkwado "Jason Njoku bụ onye nwe ogige ịntanet nke e ji ekiri ejije a kpọrọ Iroko TV arịọla Ndigbo arịrịọ maka maka okwu o kwuru banyere asụsụ Igbo. Ọ bụ n'afọ 2019 ka Maazị Njoku dere n'akara Twitter ya na ụmụ ya ""na-amụ asụsụ French. Ga-amụ asụsụ Mandarin na nsote ya ruo afọ iri na-abịa. Ha amaghị asụ Igbo dịka ya onwe ya mana nke ahụ enwghị ihe o mere makana ụwa aghaghị ama jijiji"". Ihe were ọtụtụ ụmụ afọ Igbo iwe nke mere ha ji rotekwa ya dịka ụfọdụ mmadụ malitere atụmatụ ịkwatụ ụlọọrụ ya site n'iwepu ya n'ọdụ ahịa Google Playstore. Mana dịka ndị mmadụ gara n'igwe ga kwado Iroko TV n'izu ụka gara aga, Maazị Njoku pụtara rịọ mgbaghara. Ọ bụ n'akara Twitter ya ka ọ dere arịrịọ a dịka ọ na-ekele maka etu e siri kwado ya na Playstore. Ọ sị na ya dara ya n'ihe o mere ma na-ekwukwa na ya bu onye Igbo kpọmkwem dịka ya na ụmụ ya na-aza aha Igbo sọsọ. Cheta na ndị mmadụ malitere na-ekesasị atụmatụ ịkatọ ụlọọrụ Iroko TV na ndị ọzọ na Playstore. Ha dere na ha mere nke a iji megwara ihe ha sị na e mere Maazị Adamu Garba na akụrụngwa soshal midia ya a kpọrọ Crowwe. Cheta na e wepụrụ Crowwe na Playstore dịka ọtụtụ mmadụ katọchara ya ma degaara Google mkpesa. Adamu Garba mechara sị na ọ bụ ya ji aka ya wepu ya bụ akụrụngwa. A na-eche na nkatọ ndị mmadụ katọrọ Crowwe metụtara okwu Maazị Garba kwuru oge Naijirịa machiri Twitter. Maazị Garba sibu na dịka Twitter nọzị na mmachị, na ọ bụ ohere Crowee ga-eji were ọnọdu ọfụma. Dịka atụmatụ pụtara, ndị mmadụ na-akwado Iroko TV malitere amụma nke ha na-asị ka ndị mmadu ga na Playstore ga-akwadosie ya ike. Mana, dịka BBC Igbo hụrụ na nyocha e mere na Playstore, okwu nkatọ etinyere na Iroko App di ole na ole n'ụbọchị 18 nke ọnwa Juun ikesa atụmatu ahụ malitere na soshal midia. Ugbua, ndị nke na-akwado ya bụ ọkankụ, ma ka na-arịkwa elu. Adamu Garba mere onyonyo na Facebook ya were na-akatọ atụmatụ ide ajọ ihe banyere Iroko TV. Ọ sị na ya na-akwadosi Iroko TV ike makana ọ bụ ogige ya na ezinaụlọ ya ji ekiri ejije dị icheiche. Ọ sịkwa na Jason Nkoju bụ ezigbo mmadụ, na ọdịmma obodo na ndị mmadụ na-anụ ya ọkụ n'Obi. Ọ rịọrọ ndị mmadụ arịrịọ ka ka hapụ ide ihe ọbụla adịghị mma maka Iroko TV. Kedu ihe Iroko TV kwuru banyere ihe a na-akpọtụ? BBC Igbo kpọtụrụ Iroko TV ịmata etu ha si hụta nkata a na-akpa megide ha. Ha sịrị ka anyị dere ha email banyere ya. BBC Igbo dekwara ya bụ email ma na-eche ka ha saa ya. Ha mee etu ahụ, ọha ga-ahụ ha n'ibe akwụkwọ a. Mana, ka okwu dị ugbua, ndị mmadụ ka majuru na ogige Iroko TV na Playstore na-ede nkwado ha aghara aghara." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57537000 +politics Femi Fani-Kayode: Precious Chikwendu ebola otu ụkọchukwu ịkụnye ọgbaghara n'etiti ya na di ya "Precious Chikwendu bụbu nwunye Femi Fani Kayode bụbụ mịnịsta njem ụgbọelu ebola otu ụkọchukwu a kpọrọ Pastọ Emmanuel Olorunmagba ebubo na aka ya dị n'esemokwu ya na di ya. Mana Olorunmagba nke ụka nke Total Liberation Mission n'onwe ya na-akatọ Precious maka ihe ọ kpọrọ 'okpotokpo asị' ọ na-atụgide di ya na soshal midia. N'ozi o depụtara n'Instagram, Precious,boro ebubo na ọ bụ Pastọ Olorunmagba kpatara esemokwu ya na di ya site na ị na-akụnye ya mkpụrụ ọjọọ n'ime megide ya. O kwuru na ụkọchukwu ahụ kusuru 'ọtụtụ ọgụ' dara n' etiti ya na di ya ma na-abịa n'ụlọikpe iji gbara FFK ama ihe pụtara n'ụlọikpe. Precious onye gara n'ihu boo ebubo na Pastọ Olorunmagba kpọrọ ya 'Delilah na Vashti' kwukwara na ụkọchụkwu ahụ nwere ụfọdụ ụmụnwaanyị ọ kwadoro ka ha nọchie anya ya n'ụlọ di ya FFK. Cheta na Precious na di ya bụ Fani-Kayode nwere okwu n'ụlọikpe banyere onye n'ime ha abụọ ga-akpọ ụmụ anọ ha mụkọrọ. Ụkọchukwu Olorunmagba dere n'akara Facebook ya sị na ebere ya na-emere ụmụaka anọ Precious na FFK mụrụ ma gwa Precious ka o meere ha ebere na ha nwere ike ịgụta ihe ndị ọ na-ede na soshal midia banyere di ya. Ọ sị na ""nwaanyị gwara ụmụagbọghọ na-arụrụ ha ọrụ ka ha bo FFK ebubo idina ha n'ike, pụta ziri sị na nwoke anaghị eme ọfụma n'elu agwa?"" Ọ gara n'ihu kwuo na Precious nwere ekworo nke mere na ọ naghị achọ ka nwaanyị ọzọ rute FFK nso bịaziri kwuo na FFK na-ada mba n'elu akwa. Ụkọchukwu Olorunmagba kwuru ""nwaanyị wetuo belata asị ị na-atụgide nna mụrụ ụmụ anọ gị, mgbe ụmụaka ahụ ga-eto ha ga-amata nke bụ eziokwu"". Ihe sere Precious na Fani Kayode Esemokwu dị n'etiti Femi Fani-Kayode na nwunye ya Precious Chikwendu malitere n'ọnwa Sepụtemba afọ 2020 mgbe akụkọ fesara na haa abasaala. E ruru n'afọ 2021 Chikwendu gbara akwụkwọ n'ụlọikpe na-ebo Kayode ebubo na ọ na-eti ya ihe ma sị ka e kewaa agbamakwụkwọ ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59613343 +business Agaghị m ahapụnwu ọrụ 'welder' banye ọrụ ọzọ - Nwaanyị na-akpụ igwe Ụmụnwaanyị na-akpụ igwe n'ụwa niile bụ naanị pasentị anọ dịka ndị Welda Guru siri dee. Amara Onwuka so n'ime ụmụnwaanyị pasentị anọ ndị a, dịka ọ tọgbọrọ asambodo o nwere n'agụmagụ 'Philosophy' wee gaa nweta asambodo n'ịkpụ igwe. Ọ gwara BBC Igbo na ya agaghị ahapụ ọrụ ịkpụ igwe mee ihe ọbụla ọzọ maka na ọ baala ya n'ụmị. Ọ na-akpụ ụdị igwe dị icheiche e ji arụ ụlọ nakwa nke e ji enyere ndụ aka. Mana kedụkwanụ etu o si ebu igwe ọ kpụrụ? Kirie mkparịtụka anyị na ya ugbua ka ị chọpụta. https://www.bbc.com/igbo/articles/cnkxg4073gno +business Fuel Scarcity: Lee etu ụkọ mmanụ ụgbọala si anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ "Ụmụ Naịjirịa pụtara n'ụtụtụ Monde chọpụta na ahịrị ụgbọala amalitekwala ọzọ n'ebe dị icheiche. Ihe ahụ gara n'ihu rue ụbọchị Tuusde a dịka BBC Igbo gara gbaa ọtụtụ mmadụ ajụjụ ọnụ. Ndị na-akwọ ụgbọala na-ekwu na ebe niile tọgbọ chakoo, na o nweghizi ndị mmadụ ha hụrụ iburu. Ebe ndị ọzọ na-ekwu na ụkọ emeela ka ọnụ ya bụ mmanụ ụgbọala rịa elu. Bobby Eberechi Dick bụ onyeisioche ndị na-ere mmanụ ụgbọala tinyere ọnụ n'okwu a. Ọ sị na NNPC bụ ndị ọ bụ naanị ha na-ebubata mmanụ agbịdị na-eresi ndị nkịtị mmanụ ahụ nke mere ọ ji dị oke ọnụ maka na ndị ahụ na-ere ya n'ọnụ ọbụla sọrọ ha. Dick sị ""ahụhụ ọzọ anyị na-agagbiga bụ na ụzọ e si aga ọdọ mmanụ agbịdị n'ọwụnwa anyanwụ emebichaala, ọ na-eme ka ụgbọala tanka anyị na-ada nke na-ebutere anyị ọghọm n'ahịa anyị na-azụ"". Nke a bụ ugboro abụọ a na-enwe ụkọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa n'afọ 2022." https://www.bbc.com/igbo/articles/c2xn16rmvylo +sports Wilder vs Fury: Kedụ onye ga-akụpụ ibe ya ọkwụrụ n'anya n'etiti Wilder na Fury? "Taa ka anyị ga-ama mbe abụọ nke bụ oke dịka Deontay Wilder na Tyson Fury ga-apịa ọkpọ na Las Vegas n'ogige mgbande ukwu WBC. Nke a bụ ugboro abụo ha ga-ezute onwe ma cheta kwa na mgbe mbụ ha zutere onwe ha na onweghi onye meriri. N'agbanyeghi na Wilder kuturu Fury na agba nke iri na abụo na asọmpị mbu ha kama Fury mere ihe tụrụ uwaniile n'anya dịka o biliri were lụwa kwa ya bụ ọgụ. Nwaafọ Naijirịa na Mike Tyson na-ekwu na ọ bụ Tyson Fury ga-emerị kama ndị dịka Evander Holyfield, Larry Holmes na David Hayes na-ekwu na Wilder ga emerị fury. Ọ bụ n'ọnụ ụtụtụ Sọnde na elekere anọ ka ya bụ ọkpọ ga-erute ihe onyonyo na mpaghara Afịrịka. 'Boko Haram na-akwụsị ụgbọala achọ ndị otu kraịst na ndị ọrụ gọomentị' Ndị otu Boko Haram awakpola obodo Garkida nke dị na okpuru ọchịchị Gombi dị na Adamawa steeti. Ndị obodo Garkida gbara ọsọ kwuru na ndị boko Haram na ndị nchekwa na-alụ ọgụ mgbe ha sị obodo ha gbapụ n'ụbọchị fride. Akụkọ yiri ibe bụ na onye njem gbara ọsọ ndụ n'ụzo jikọrọ Damatutu na Gashua kwuru na Boko Haram mechiri okporo ọzọ a na-acho ndị ofufe nke Kraist, ndị ọrụ goomentị na ndị nchekwa. O kwukwara na ha jidere ndị otu nchekwa vigilante n'ụzo ahu ebe onyeisi ndị Vigilante kwetara na awakporo ụfọdụ ndị otu ha. Nke a na-eme dịka onyeisia ndị agha Naijirịa bụ Yusuf Brutai na-ekwu na ọfọrọ abalị ole naole ka ndị gha Naijirịa merie ndị otu Boko Haram. 'Ndị ụlọomeiwu tinyekwaranụ Buhari anya n'ihe gbasara ego Abacha a' Ndị otu pati PDP akpọkuola ndị ụlọomeiwu ka ha gbatara Naịjirịa ọsọ enyemaka. Ha sị na ha chọrọ ka ndị ụlọomeiwu kwanye Onyeisiala Muhammadu Buhari ọkụ n'ike ịma ihe ọ chọrọ iji ego Abacha zuru nke ndị Amerịka welatara, mee. Lee ihe ha dere na soshal midia: Coronavirus na Saụt Koriya Mba Saụt Koriya ekwuola na ọnụọgụgụ mmadụ ole bu ọrịa Coronavirus na mba ha mụbanyere karịa etu ọ dibu, n'ime naanị otu ụbọchị. Kim Gang-Lip bụ osote minista na-ahụ maka ahụike na mba ahụ sị na ha achọpụtala mmadụ narị abụọ na itoolu bukwa ya tinyere mmadụ narị abụọ na anọ bubu ya. E duola Riek Machar bụbu onyendu ndị otu nnupuisi n'iyi ọrụ dịka osote onyeisiala mbụ nke mba Saụt Sudan. Nke a bụ atụmatụ Onyeisiala Salva Kiir wepụtara iji kpee udo ha na-atụ anya ga-akwụsị agha mba ha lụwara kemgbe afọ isii gburula ihe ruru mmadụ puku narị anọ. Lampard akuzierela Mourinho na 20 bụ ọgụ Frank Lampard na-achịkọta Chelsea kuzirila Jose Mourinho na ""Twenty bụ ọgụ"" dịka Chelsea wefere obi azụ wee nyụọ Tottenham anya mgbe ha zutere taa. Nkuzi a bịara dịka Chelsea ji goolu abụọ a satara otu jide azụ ụlọ ha ma merie Tottenham. Gụọ ya n'uju ebe a: Lampard akuzierela Mourinho na 20 bụ ọgụ Onyeisiala Najirịa ekwuola na oge erubeghị mgbe a ga-agbape okeala Naijirịa ma rịọ mba ndị ha na Naijirịa nwere okeala ka ha nwee ndidi. Ọ bụ mgbe onyeisiala Burkina Faso bụ Roch Marc Christian Kabore chọtara ya n'ụbọchị Fride n'ụlọ onyeisiala Naijirịa ka Buhari kwuru nke a. O kwukwara na ọ bụ mgbe ngalaba ehiwere ime nyocha maka okeala Naijirịa wepụtara mpụta nyocha ha ka ọ ga-ama ma a ga agbape okeala Naijirịa. Buharị siri na ihe kacha mkpa eji mechie okeala bụ makana ndị omekome sị ya ebubata ngwa agha na ọgwụ ike. O kwukwara sị na kamgbe agbachiri okeala Naijirịa na mkpamkpa ndị omekome ebelatala ma sị kwa na ndị ọrụ ugbo na Naijirịa na-akọpụta osikapa na-agbazị aka ahịa. Buharị gwara Kabore na uche ya dị na ihe Burkina Faso na-agabiga maka ịgbachị okeala Naijirịa ma sị ya na ọ na-eme ihe niile onwere ike ime iji hụ na agbapere okeala. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Gọọmentị Kaduna Steeti ekuola na ha ga-aga ụlọikpe mkpegharị maka mkpebi ikpe ụlọikpe ukwu banyere ndị otu akpọrọ Islamic Movement of Nigeria atọghapụrụ ụbọchị Fraịde. Gọọmentị Kaduna sị na mkpebi ụlọikpe a tụrụ ha n'anya dịka ha sị na ndị a atọghapụrụ wakporo ndị agha n'ezie n'afọ 2015. Bernie Sanders bụ onye sepụtere isi karịcha ụgbua n'ime ndị na-achọ ohere iji ọkọlọtọ pati Democrats zụọ ntụlịaka onyeisiala Amerịka agwala ndị mba Rụshịa ka ha Wepụ aka na ndọrọndọrọ ọchịchị ha Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ nyocha na Amerịka gbara ama na Rushịa na-akpa nkata ịhụ na Donald Trump meriri." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51596155 +business Etu e si wakpo m maka ajụju banyere nde dọla 56 World Bank nyere Abia - Obinna Ichita "Obinna Ichita bụ onye omeiwu na-anọchite ndịda Aba bụ nke Bekee kpọrọ ""Aba South"" n'Abia Steeti kọwara BBC Igbo etu e si mwakpo ya n'ụbọchị Wenezde. Ọ sị na mwakpo a mere dịka ya na ndị ọ na-anọchite anya ha na-eme ọgbakọ n'Aba Sawụt. N'okwu ya, ọ kọwara BBC Igbo na ihe a mere atụghị ya n'anya dịka ndị mmadụ bidoro wetewere ya ozi iyi egwu dị iche iche kemgbe ọ jụrụ ajụjụ ole ma ole maka ego o kwuru ruru dọla nde iri ise na isii nke ụlọakụ mba uwa ""World bank"" zitere Abia Steetị maka ịrụzị okporo ụzọ nke Ohanku, Obohia, Ngwa, Port Harcourt road, Uratta nakwa nke Omuma.Omeiwu Ichita sị na ajụjụ ndị ọzọ ọ jụrụ bụ ajụjụ banyere ego ọ sị ruru Ijere kwuru ijere Naira nke enyeghachiri Abia Steetị site na aka 'Paris Club refund' nakwa ego nrite mmanụ agbidi gọọmentị etiti kenyere Abia Steetị. Maazị Ichita kwuru na okwu ụzọ ndị a na adịghị mma bụ isi okwu ọgbakọ ha nọ n'ime ya mgbe ndị omekome bu ụgbọala atọ bịa wakpoo ha. O kwuru na ọnọdụ ụzọ ndị a emela na ụmụ akwụwkọ be ebe ndị ahụ anaghịzị a ga akwụkwọ, ma ụlọ ndị nọ na mpaghara okporo ụzọ Port Harcourt emechichala. O kwukwara na dịka o zịpụrụlara ozi maka iyi ndụ egwu a nye ndị ọrụ nnọchite anya Briten na Naijịrịa bụ British High Commission, na ndị ọrụ nnochite anya mba Amerika nakwa nke mba Europe ole m ole dịka okwu a metụtara ego si na mba Europe Maazị Ichita gwara BBC Igbo na maka okwu iyi ndụ egwu a na ọ gwara Komịshọna ndị uweojii na Abia Steetị, ndị ọrụ nchekwa pụrụiche bụ DSS na Abia Steetị nke mere gọọmentị Abia Steetị ji zipụta ozi ekwu na ozi ya ezighi ozi nakwa ọ bụghị eziokwu. O kwukwara na dịka ha zigarala ndị ọrụ nchekwa ozi banyere mwakpoo a mere n'ụbọchị Wenzde, na ha ma ihu ụfọdụ ndị mere mwakpoo a nke ha kọwara ndị ọrụ nchekwa n'ozi ha. Na nchịkọta o kwuru na ọ na atụ anya nnyocha ndị ọrụ nchekwa ga ewepụ ihe nwere isi. Ichita sị na n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Julaị, o zigara gọọmentị Abia Steetị ozi gwaa ha bịa gbatara ndị 'Aba South' ọsọ enyemaka maka ụzọ niile nọ ebe ahụ mebere emebi, mana na ọ nweghi ihe ọbụla gọọmentị mere banyere ya. Maazị Ichita sị na bido n'ụbọchị ọ jụwara ajụjụ ndị a ka ndị na-eyi ndu egwu bidoro zitewere ya ozi ọjọọ. N'ọnwa Jụlaị 2021 gọọmentị Abịa steeti kpọrọ okwu ka ndị ọrụ nchekwa nyochaa okwu banyere iyi ndụ ya egwu Omeiwu Ichita kwuputere. N'oge ahụ Kọmishọna mgbasa ozi na steeti ahụ bụ John Okiyi-Kalu kwuru ka na-adị mkpa ime nnyocha banyere ya bu okwu ma chọpụta nke bụ eziokwu. O kwukwara na o zigarala ndị orụ nchekwa ozi banyere ndị a na eyi ndu ya egwu ma gwaa kwa ha maka ihe ntisa mere n'ọgbakọ ha n'ụbọchi Wenzde, nke butere nkụsasị ihe, nkuri ụgbọ ala ya nakwa mmerụ ahụ ụfọdụ ndị otu ya. BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Steetị ahụ bụ Geoffrey Ogbonna n'ekwe nti ya taa bụ Tọọzde maka okwu mwakpoo a, ọ kọwara BBC na okwu dị etu a adighiri ya i tinye ọnụ dịka a ka na-eme nnyocha na ya. O kwukwara na ọ bụrụ na n'ezia na Maazị Ichita eziterela ndị uweojii ozi mwakpoo a, ọha ga-anụ mpụtara nnyocha ha ma ha mechaa. Mgbọ BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnụ Maazị Okiyi-Kalu banyere mkpesa Omeiwu Ichita na-eme mana ọ zaaghị ekwentyị ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58339102 +politics Ọchịchị Buhari b��� nke kachasị njọ kemgbe ụwa tụ ụwa - Otu na-eme ngagharịiwe na London "Otu kpọrọ onwe ha ""Coalition of Southern Nigeria and Middle Belt of Nigeria"" na mba Briten emeela ngagharịwe kachasị ha kpọrọ 'Mega Rally'. Otụ ahụ gụnyere ndị ọwụwa anywanwụ, ọdịda anywanwụ nakwa ndị etiti ndịda Naịjirịa mere nke a n'isi obodo mba ahụ bụ London. Otu onye n'ime ha bụ Efuru Nwapa gwara BBC Igbo na ọchịchọ ha gụnyere mgbanwe ala Naịjirịa nakwa nwugharị ọnọdụ ọchịchị bụ 'Restructuring' na Bekee. ""Buhari bụ nje kachasị njọ kemgbe, anyị chọrọ mba gbanwere agbanwe maọbụ ime ntụliaka iji chọpụta ọdịnihu anyị"" ka Nwapa kwukwara. - Ntọghapụ ndị na-achọ mmwereonwe anwụchiri dịka Nnamdi Kanu na Sunday Igboho. - Ịkwụsị oke ogbugbu ndị mmadụ site n'ọnọdụ nchekwa ọjọọ. - Ịkwụsị oke mmegbu na mkpagbu n'aka ndị ọrụ nchekwa. - Ịwugharị ọnọdụ ọchịchị na Naịjirịa pụtara ""Restructuring""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57955938 +business Nnewi Timber Market Fire: Ndị ahịa na ndị uweojii na-arụ ụka maka ọkụ gbara n'ọgbọ osisi na Nnewi "Ndị na-azụ ahịa n'ọgbọ osisi dị na Nnewi nọ na nnukwu ihe iru uju ugbua n'ihi ọkụ gbapịara ụlọahịa ha. Ya bụ ọkụ malitere na mgbede ụbọchị Wenezde gbagide ime abalị niile ruo ụtụtụ ụbọchị Tọzde a. Dịka otu akara a kpọrọ 'Nnewi City' na Twitter siri dee, ọ bụ ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ Anambara steeti bịara gbanyụọ ya bụ ọkụ. Ndị mmadụ boro ebubo na ọ bụ ndị uweojii kpatara ọkụ ahụ ebe ha na-achụ ndị na-ese anwụrụ ike na ya bụ ahịa. Mana ndị uweojii kwuru na ọ bụ ndị ahụ na-ere anwụrụ ike tinyere ọkụ iji gbochie aka ndị uweojii ịkpata ha. Ngwaahịa ndị mmadị ruru nde kwuru nde naịra lara n'iyi n'ọkụ ahụ. Oge BBC Igbo kpọrọ onye nọ n'ahịa ahụ n'elekere iri na otu na ọkara nke ụtụtụ Tọzde, Febrụwarị 18, o kwuru na ọkụ ahụ ka na-agbakwa. Otu onye ahịa na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọkụ ahụ malitere n'ehihie ụbọchị Wenezde, Febrụwarị 17, 2021. O kwuru sị: ""Anyị hụrụ ka ndị uweojii na'agbada na ndagwurugwu dị nso n'ahịa ahụ, ebe ha na-ekwu na ndị mmadụ na-anọ ese anwụrụ ike."" ""Mana ndị ahụ ha na-achụ agbakpuola n'ime ime nke mere ndị uweojii jiri were 'lighter' mụnye ọkụ n'ahịhịa dị ebe ahụ."" ""Uche ha bụ na anwụrụ ọkụ ga-eme ka ndị ahụ gbapụta ka ha nwuchie ha, mana ndị ahụ si ụzọ ọzọ gbafuo."" ""Ọkụ ahụ ndị uweojii munyere banyere n'ime 'saw dust' sizie ebe ahụ malite ịgba n'ahịa niile."" ""Oge ndị uweojii hụrụ nke a, ha ji ụjọ gbafuo ka ndị mmadụ ghara iji iwe merụọ ha ahụ."" Nwa amadi ahụ gwara anyị okwu kwukwara na ndị ahịa ji iwe mebie otu ụgbọala ndị uweojii bụ nke ha hapụrụ gbaa ọsọ. Ọ bụ ndị ekperima tinyere ahịa ahụ ọkụ - Ndị uweojii Anambra steeti Haruna Mohammed, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti gwara BBC na ebubo ndị ahịa boro ndị uweojii abụghị eziokwu. Mohammed kọwara na ọ bụ ndị otu nzuzo na ndị na-ere anwụrụ ike na-alụ ọgụ nke mere ka ndị uweojii gaa ebe ahụ wee nwụchie mmadụ anọ n'ime ha. Oge ndị uweojii ahụ chọrọ ịpụ, ndị ekperima ahụ nọchiri ụzọ ma mụnye taya moto ọkụ iji gbochie ndị uweojii ịkpụrụ ndị otu ha. Ọ bụ ọkụ taya ahụ banyere na 'sawdust' wee si ebe ahụ banye n'ọgbọ ahịa ahụ. Mohammed jụrụ ajụjụ sị: ""Ihe e ji amụnye ọkụ o so na ngwaọrụ ndị uweojii?"" ""N'ime ndị uweojii na ndị na-ese anwụrụ ike, onye ga-eji 'lighter' maọbụ 'matches' iji tinye ọkụ?"" Haruna Mohammed gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị ekperima ahụ wakporo ndị uweojii ma kurie otu ụgbọala ha. Mana ndị uweojii gbara mbọ nwụchie ihe karịrị mmadụ iri atọ na ise n'ime ndị butere ọgbaaghara ahụ. ""Nnyocha ka na-aga n'ihu ugbua,"" Haruna na-ekwu." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56094430 +politics Elisha Abbo: Abike Dabiri akpaliela ndọrịtaụka maka APC na PDP "Ụmụ Naijiria eriela Abike Dabiri na ndụ maka ibuga okwu gbasara Senetọ Elisha Abbo mara nwaanyị ụra n'okwu otu ndọrọndọrọ ọchịchi. Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia ụbọchị Tuuzde gosiri ebe Senetọ Elisha Abbo mara nwaanyị ụra chara ọkụ n'ọdọahịa. N'itinye ọnụ n'okwuahụ, Abike Dabiri sịrị na ""ọ bụkwa nwoke 'PDP' a sịrị na o meriri otu n'ime ụmụnwaanyị ndị omeiwu anyị nwere ugwu bụ Senatọr Binta Masi Garba."" Okwu ahụ ọ tụpụrụ kpasuru ọtụtụ ndị mmadụ iwe na soshal midia ma mee ka ha bido ndọrịtaụka ndị ka mma n'etiti APC na PDP dịka o siri gbasa ileba anya n'agwa ọjọọ ndị otu pati ha kparala. Ya bụ ndọrịtaaụka mere aha Abike Dabiri na Ganduje ji na-ewu na soshal midia dịka ndị mmadụ na-arụtụ aka agwa ọjọọ ndị nọ n'APC kparala nke ndị otu ha emeghị ihe ọbụla banyere ya nakwa ihe ndị PDP kwuru makaa onye otu ha. Ha kwuru na Abike Dabiri na ndị otu pati APC na-agbado mmehie ndị pati ha aja, ma nwere opi afụ nke ndị pati PDP. @Papadonkee, @DRmuzoic nakwa @tonyeray33 nyere ọmụmatụ gọvanọ Ganduje nke ihe onyonyo fegharịrị gosiri ebe ọ na-afọnye ego n'akpa akwa ya nakwa Omo-Agege onyee eboro ebubo izu ọfọ ụlọomeiwu. Ọtụtụ ndị PDP welitere isi gụnyere Atiku Abubakar, Reno Omokri na Femi Fani Kayode katọrọ agwa Senetọ Elisha Abbo sị na ọ bụ ihe jọgburu udele, sigbuo nkapị. Ha kpọrọ oku ka ndị uweojii lebanye ya anya ma nye nwaanyị ndụmọdụ ka ọ gba Abbo akwụkwọ n'ụlọikpe. Pati PDP n'onwe ya katọkwara agwa onye otu ha kpara sị na ""o nweghị onye ṅụjuru mmiri ara afọ ga-akpa ụdị agwa ahụ."" Ha rụtụrụ aka na" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48856260 +sports Tottenham vs Man United: Ha abụọ eshitela otu pọịntị n'ajọ ọnwụ "Ndị Tottenham ji otu ọkpụ goolu sị ndị Manchester United ""nnọọ"" dịka ha nabatara ha n'azụ ụlọ ha, mana Man Utd mechara zọta isi onwe ha. Goolu ndị Tottenham si n'aka Steven Bergwijn na nkeji 27 e ji malite ya bụ egwuregwu, gosiri Man Utd na Jose Mourinho bụbu onye nchịkọta ha anabataghị ha n'ụlọ ọhụrụ ya ka ọ gbaa ha nkiri. N'agbanyeghị na ọ bụ a gbatu gbatu a ṅụọ mmiri, otu abụọ a nwara ike ha ịma ndị ga-azọta pọịntị mgbe a ga-egbuchi bọọlụ. Na nkeji 81, Bruno Fernandes ji penariti nyere Man Utd goolu dịka Eric Dier kwaturu Paul Pogba, mere ka ọ bụrụ onye lawa onye lawa. Mwebata e webatara Pogba gbanwere egwu ndị Man Utd, mee ka ha kpawakwa ike. Na nkeji 78, e webatara Odion Ighalo bụ nwaafọ Naijiria na-eme ndị mmadụ obiọma nso nso a, mana ọ gbaghị aka ahịa ruo mgbe e gbuchiri bọọlụ. Na nkeji 90 na ụma, ndị Man Utd tikwara mkpu ka e nye ha penariti oge ọ bịara dị ka Dier ọ gbaturu Bruno, mana ihe nkiri enyemaka Video Assistant Referee (VAR) nyochara ya sị na otu abụghị n'ezi. Cheta na mgbe otu abụọ a zutere tupu ọrịa Coronavirus achụkpuo onye ọbụla n'ime ụlọ, Man Utd ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie Tottenham n'Old Trafford. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/53117205 +entertainment Christy Essien-Igbokwe: Nwaanyị a lụtara na mba bịara bụrụ Ada Igbo ji eme ọnụ "Ọ bụrụ na a jụọ ụfọdụ ndị ntorobịa taa onye tiri egwu a kpọrọ ""Tetanụ n'ụra"", ọtụtụ n'ime ha agaghị ama onye ọ bụ, nke a bụ ihe ọnwụ mere anyị. Maka na ọ bụrụ na Christy Essien-Igbokwe ka dị ndụ taa, olu ogene ya ka ga na-ada n'igwe redio nakwa TV dị icheiche. Taa bụ abalị iri na otu nke ọnwa Nọvemba afọ 2020, ka otiegwu Christy Essien-Igbokwe gaara agba afọ iri isii, mana ya dịba. Onye bụ Christy Essien-Igbokwe Christy Essien-Igbokwe so n'ụmụnwaanyị otiegwu a nụrụ aha ha anụ na Naịjirịa. Nne na nna ya bụ ndị Akwa Ibom steeti, mana o toro n'ala Igbo, n'aka otu enyi nne ya, maka na nne ya nwụrụ oge ọ gbara naanị afọ iri na abụọ. Ọ gara akwụkwọ sekọndịrị n'Aba, Abia steeti, ebe ahụ ka ọ nọ malite ịgụ egwu. O mechara lụọ di onye Igbo, aha ya bụ Edwin Chukwunenye Igbokwe, onye Awka n'Anambara steeti, etu a ka o si bụrụzie onye Igbo kpọmkwem. Ha mụtara ụmụ anọ ma nwee ụmụụmụ atọ tupu ọ laa mmụọ. Otu n'ihe Christy Essien-Igbokwe ji bụrụ ọpụrụiche bụ maka na ọ na-asụ ọtụtụ asụsụ na-abụghị asụsụ nne na nna ya bụ Efik. O tiri egwu n'asụsụ Igbo, Hausa, Yoruba, Efik, Ibibio nakwa Bekee. Nke a mere e ji akpọ ya 'Nigeria's Lady of Songs'. Egwu ya ndị mmadụ kacha mara bụ nke o tiri n'asụsụ Yoruba, ọ kpọrọ 'Seun Rere', nakwa nke o ji Igbo tie ọ kpọrọ 'Tetanụ n'ụra'. Nwa ada a sokwa na ndị hibere otu ' Performing Musicians Association of Nigeria' (PMAN) n'afọ 1984. O mechara bụrụ nwaanyị mbụ chịrị otu ahụ malite n'afọ 1996 ruo 1999. Efere egwu ya nke ọ kpọrọ 'Ever Liked my Person' bụ ya kacha ree ahịa. Ndị ma anya egwu kwuru na ya bụ egwu rere karịa otu nde bụ nke Bekee kpọrọ 'platinum'. Lee efere egwu niile Christie Essien-Igbokwe tipụtara na ndụ ya: Iji gosi na ọ bụ gbazuo agụ, Christy Essien-Igbokwe sonyere ndị otu ejije a kpọrọ 'New Masqurades' Ọ bụ ya bụ nwunye Jegede Sokoya na ya bụ ejije nke wuru ewu na Naịjirịa niile n'oge ahụ. E nwere ike ikwu na ọ bụ otu ejije a nke Christy Essien-Igbokwe so na ya hibere ntọala maka ngalaba ejije Naịjirịa bụ Nollywood taa. Oge Nollywood malitere, nwa ada a sokwa mee ejije ụfọdụ dịka 'Flesh and Blood' na 'Scars of Womanhood'. Christy Essien-Igbokwe gbara mbọ maka ịkwalite ọnọdụ ụmụnwaanyị na ụmụntakịrị na Naịjirịa. O so na ndị hibere ulọọrụ a kpọrọ 'Essential Child Foundation' n'afọ 1992, mana ọ malitere ọrụ na 1994 Ọrụ ha bụ inyere ụmụaka enweghị nne na nna aka. N'afọ 2013, Edwin Igbokwe bụ di Christy Essien-Igbokwe gụgharịrị ụlọọrụ ahụ aha, kpọzie ya Christy Essien Igbokwe Memorial Foundation (CEIMF) Gọọmentị Naịjirịa nyekwara ya nturuugo pụrụ iche a kpọro 'Member of the Order of the Federal Republic' (MFR). Ihe ndị ọzọ dị mkpa gbasara Christy Essien-Igbokwe Ndị ụlọọrụ Google mere esere ese ha na-akpọ ""doodle"" iji chetara ụwa maka ụbọchị amụrụ Essien-Igbokwe bụ nwaanyị nwere olu ụtọ ka nnụnụ. BBC jụrụ nwa ya bụ Kaka Igbokwe ihe ndị mmadụ amaghị maka nne ya, o kwuru sị ""ụwa niile amaghị na ọ bụ onye dị obiumeala. ""Ụbọchị ncheta ọmụmụ ya kwa afọ, ọ na-esonye ndị nwaenwenne nakwa ndị ụbịam eme emume ya. ""Ọtụtụ oge o mere emume ncheta ọmụmụ ya, ọ bụ ndị mmadụ ji ego ha mee ya. ""Ndị bi n'obodo nna m n'Ọka dị n'Anambara steeti ma ya ọfụma ọfụma. Ọ na-esi nri ndị Igbo ma na-asụkwa asụsụ anyị ọfụma karịa ụfọdụ ndị Igbo."" Ihe ị kwesịrị ịma maka Christy Essien-Igbokwe Google emekwaala ndị Igbo dịka Chinua Achebe, Flora Nwapa nakwa Stephen Okechukwu Keshi ""doodle"" a ụbọchị ncheta ọmụmụ ha. Achebe bụ ụbọchị 16 nke Nọvemba 2017, nke Nwapa bụkwa n'ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị 2017, ebe nke Keshi bụ ụbọchị 23 nke ọnwa Jenụwarị 2018. Essien-Igbokwe so n'ụmụnwaanyị ndị egwu ha mere ndị mmadụ obi aṅụrị na Naịjirịa. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-46168808 +health Lassa Fever Outbreak: Etu e si eme ka garri ghara ibunye mmadụ ọrịa Garị bụ nri ndị mmadụ na-erikarị na Naịjirịa. Ebe ụfọdụ na-aṅụ ya aṅụ, ụfọdụ na-elo ya ka nri olulo. Aha garị na-ewu ewu ugbua makana ndị mmadụ na-ekwu na iri ya nwereike ịbụ usoro e ji ebute ọrịa Lassa. Ihe mere nke a bụ makana anaghị esi gari a na-aṅụ aṅụ n'ọkụ. Isi nri n'ọkụ so n'ime usoro kachasị e ji egbu nje na-adị na nri. Okwu garị malitere n'etu e si eme ya. Njem garị na-amalite n'ugbo, ebe ọ ga-esi gaa ebe a ga-akwọ ya ma a bachasịa ya. Akwọchaa ya, ọ bụrụzịa ighe ya eghe. E ghechaa ya, a gbaa ya n'akpa ebe a ga-esi na-ewere ya ọ ma a chọọ garị a na-elo elo maọbụ nke a na-awụnye na mmiri ṅụọ. Gịnị jikọrọ garị na ịba Lassa? Ebe ndị mmadụ na-esi ekwute okwu ịba Lassa na garị bụ na a na-eche na oke - bụ anụmanụ na-ebukarị ọrịa Lassa - na-abanyekarị na garị dị n'ụlọ ma ọ bụrụ na egbochighi ya ọfụma. Mana, o nwekwara ndị na-agbasa garị n'anwụ ma ha ghechaa ya. Oke bu nje a nwereike ijiri ohere a garị nọ na mbara/ezi banye n'ime ya, metọchaa ya mgbe ọ rịrị ya elu, ma tinyekwa ya nje ahụ. Mmadụ kporozie ya wụnye na mmiri ṅụọ o kote okwu. Ọ bụrụ na ị goro garị n'ahịa lee ihe i ga-eme ka ọ bụrụ ihe agaghị ebunye gị ọrịa: Ọ bụrụ nke i ji aka gị eme ya: Site n'usoro ndị a, mgbochi ịba Lassa ga-enwe isi. Mana, matakwa na ọ bụghi sọsọ garri ka e si enweta ya bụ ọrịa, onwe etu ahụ sị eme gị biko jiri ọsọ gaa n'ụlọọgwụ. Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51222234 +politics June 12 : Ihe asaa ọchịchị onyekwuoucheya gbanwere na Naijiria n'afọ 21 "Taa bụ abalị iri na abụọ nke Juun afọ 2020 bụ ncheta emume ọchịchị onyekwuoucheya (Democracy Day). Tupu abali isii nke ọnwa Juun afọ 2018 bụ oge e megharịrị ya, a na-emebu emume a n'abalị 29 nke ọnwa Mee bụ ụbọchị ndịagha were ọchịchị nyefe n'aka ndị nkịta n'afọ 1999. Mana Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari higharịrị ya rue abali 12 nke ọnwa Juun, iji kwanyere Moshood Abiola, bụ onye nwụrụ n'ọgụ inwenta ọkwa sitere na mmeri o nwere na ntuliaka onyeisiala e mere n'a Juun 12, afọ 1993. na mmeri o meriri na ntuliakagha O meela afọ iri abụọ na otu ọchịchị Naijiria banyere n'aka ndị nkịtị na-enweghị mgbubi ọbụla; afọ asatọ nke Olusegun Obasanjo, afọ abụọ nke Musa yar'Adua, afọ isii nke Goodluck Jonathan na afọ ise nke Buhari. Ajụjụ ụfọdụ ụmụ Naijiria kpụ n'ọnụ bụ ole ihe ọchịchị isi n'aka ndị uwe kakị banye na aka ndị uwe agbada wetara na Naijiria ka ọchịchị onyekwuoucheya bụ ịkwọ aka tiere ọkụkọ akị? Lee ihe ise gbara ọkpụrụ o wetara dịka ndị okwu ọchịchị na mwulite obodo dọrọ anya sị kọwaa: 1. Ohere ikwu uche gị Mgbanwe dị ọkpụrụkpụ bụ na ndị mmadụ na-eso ekwu onye ga-achị ha site na ntuliaka, ọ bụghịzị onye ndịagha tụrụ aka ha enye ya ọkwa ọchịchị. Larry Ọgụego bụ onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye sị, ""Otu ihe anyị ritere bụ na ndị mmadụ nkịtị nwere ike pụta soro na-ekwu ihe na-eme n'obodo."" 2. Ịkwanye ugwu nye ikike dịrị onye Kemgbe a banyere n'ọchịchị onyekwuoucheya, a na-agbaso Iwu Naijiria were na-eme ihe. Onye ihe e mere ya adịghị mma, ọ gaa n'ụlọikpe ịnata ikpemkwụmọtọ mana ọ dịghị otu a n'oge ọchịchị ndịagha. ""O nyela anyị ikike gbasara oke ruru anyị. Ọnụ na-eruzi anyị n'okwu."" 3. Alaka atọ ọchịchị na-arụ ọrụ Ndị omeiwu(legislature) na-arụ ọrụ, ndị ụlọikpe(judiciary) na-arụ ọrụ ha, ndị ọchịchị(executive) na-arụkwa nke ha. Ihe nke pụtara bụ na o nweghị alaka ọchịchị na-ebi okwu n'ihe ọbụla. Tupu ugbua, naanị ndịagha na-ekwu ihe a na-eme. Ha na-ekpe, na-ebi. Oguego kwuru na ""ndị mmadụ na-eme iwu na-arụ ọrụ ihe gbasara mmadụ."" 4. Mwulite akụnaụba obodo Ọkacharamara n'ihe gbasara mwulite akụnaụba bụ Boniface Chizea sị na ọchịchị onyekwuuche ya wetara mwulike akụnaụba na Naijiria ọkachasị n'afọ asatọ mbụ nke olusegun Obasanjo. Iji maa atụ, dịka ụọakụ mbaụwa bụ IMF si kwuo, akụ Naijiria na-emepụta nke a kpọrọ 'GDP n'aha ịchafụ gbaliri site na $55.65 ọ bụ n'afọ 2003 rue ijeri dọla $114.36 n'afọ 2006. Chizea sị na ego Naijiria ji echekwa onwe ya na mba ọzọ gbalitere rue nde dọla 40. Mana ọ tụrụ arịrị na ya bụ ego agbadala ugbua rue ihe dịka ijeri dọla 30 n'oge ọchịchị Buhari. Ọ bụ n'oge a ka e rere ọtụtụ ụlọọrụ gọọmenti (privatisation)resị ndị nkịtị nke wetara nnukwu ọganiru n'akụnaụba. E rere ụlọọrụ Nitel ma nye ndị nọrọ onwe ha ikike ibido ọrụ ekwentị nke mere e ji nweta ụlọọrụ MTN,GLO, Airtel na Etisalat. Atụmatụ nke mere ka ekwenti kwusi ịbụ njirimara ọgaranya mabụrụ ihe rutere ma nnukwu mmadụ ma ogbenye aka. 5. Mmepe obodo Mgbanwe ọzọ dị mkpa nke ọchịchị onyekwuouche ya wetara na Naijiria bụ mmepe obodo; okporoụzọ, ụlọọgwụ na ụlọakwụkwọ. A gbapere ọtụtụ ụlọakwụkwọ site na praimarị, sekọndarị rue mahadum. Mahadum sitere na 118 n' afọ 1990 rue 170 ugbua ( nke gụnyere mahadum gọọmenti etiti, nke steeti nakwa nke ndị nọrọ onwe ha) dịka gọọmenti nyere ikike na ndị nọrọ onwe ha mepe mahadum. 6. Mwepụ mmachi obodo ndị mepere eme machiri Naijiria Ọtụtụ mba dịka US,UK na mba ndị ọzọ di n'Yorop gbakọtara Naijiria azụ n'ihi ọchịchị aka ike n'oge ọchịchị ndị agha mana nke a gbanwere ngwangwa ọchịchị bara n'aka ndị nkịtị. Ọmụmaatụ: N'afọ 1995, oge ọchịchị Sani Abacha, gọọmenti gburu Ken Saro-Wiwa na mmadụ asatọ ndị ọzọ (Ogoni 9) maka ogbugbu e gburu ndị ichie MOSOP asatọ bụ ndịna-akwado gọọmenti, otu 'Commonwealth' mapụrụ Naijiria afọ abụọ. A machikwara ndị nọ ọchịchị na ndị ezinaụlọ ha ibanye ụfọdụ mba ofesi. Mana e wepụrụ mmachi ndịa niile ka ọchịchị laghachiri n'aka ndị nkịtị. E tinyere ndị ma nke a na-akọ n'ọkwa kwesịrị ha, ọkachasị n'oge ọchịchị Obasanjo. Nke a nwetara ezigbo mmepe na mwulite akụnaụba dịka ha si n'amamihe na nka ọrụ ka kwalite akụnaụba Naijiria. Ndị dịka Ngozi Okonjo-Iweala, Charles Soludo, Oby Ezekwesili, Nasir El Rufai, Akinwunmi Adesina, Dora Akunyili bụ ọchịchị onyekwoucheya tụpụtara ha. Mana ọ dịghịchakwaghị otu a ugbua." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-53015391 +politics Rochas Okorocha: Haaranụ Ndigbo ọkwa onyeisi Sineti "Akụkọ kachasị sepụte isi taa: Rochas zutere Buhari na Monde Gọvanọ Rochas Okorocha na onyeisiala Buhari nwere nzuko n'Abuja ụbọchị Monde. Okorocha sị na ọ gwara Buhari ka e nye Ndigbo isi ọchịchị n'ụlọomeiwu. Ọ kpọkwara Buhari oku ka ọ bịa gbape ọrụ ndị ọrụrụ n'Imo Steeti tupu ọ na-apụ. Kpụpụnụ ndị SARS gbagburu Kolade Johnson ụlọikpe - Amnesty Int'l Otu Amnesty International akpọọla oku ka e nyocha ogbugbu ndị e chere na ha bụ ndị SARS gburu otu onye egwu bọọlụ na-amasị bụ Kolade Johnson na Legọs. A gbagburu nwaokorobia ahụ na Mangoro, Legọs, ụbọchịụka nke oge ndị SARS na-achụ nwatanwoke ọzọ ọsọ n'agbataobi ebe Johnson na-ekiri bọọlu. Ọtụtụ ndị mmadụ hụrụ egwu 'Rap' n'anya n'ụwa niile nọ n'iru uju n'oke olu Ọ bụ n'ihi ọnwụ otiegwu 'Rap' a kpọrọ Nipsey Hussle bụ onye ndị ojiegbe gbagburu na Los Angeles mba Amerịka. Biko onye na-ama ọkwa nke a? Nke a bụ okwu onyeisi ụka Katọlik na mbaụwa bụ Pope Francis Pope Francis kwenyere na Messi mara nke egwu na-akụ na bọọlụ mana o rughị ịkpọ ya Chineke dị ọtụtụ ndị mmadụ na-eme. Ndị isi indi Ohaneze Ndigbo kpebiri na nzukọ ha mere n'Abakaliki ụnyaahụ na Nnia Nwodo ka tozuru ịbụ onyeisi oche ha. Ndị akpọrọ ""National Executive Committee"" (NEC) nke Ohaneze kwenyere na atụmatụ onyeisi Ohaneze n'Enugwu bụ Alex Chiedozie Ogbonna wepụtara wee nye Nwodo ihe Bekee kpọrọ ""Vote of Confidence"". Cheta na Ohaneze nweburu kepukepu ekweghim ekweghim maka nkwado ha nyere Atiku Abubakar nke ụfọdụ n'ime ha sị ezighiezi. Nkwado a mere ka Ohaneze kwewa abụọ, nke onye bụbụ odeakwụkwọ otu ahụ bụ Uche Okwukwu mechara kwuo na ha enyela Nwodo ezumike. Ndị eche na ha na-ezu ohi ehi wakporo ime obodo Kware dị na mpaghara Shinkafi na Zamfara steeti. Ndị uweojii sị na mwakpo a tara isi mmadụ iri. Na nke metụtara akụkọ a, ndị agha Naịjirịa sị na ha ga-amalitela ibuso ndị na-akpa ike a agha site n'atụmatụ ha kpọrọ ""Harbin kụnama"" Zamfara, Sokoto na Katsina bụ steeti ndị ga-ahụ agha. Onyeisiala Abdelaziz Bouteflika nke Algeria achụọla ọtụtụ ndị ime obi ya. Bouteflika bụ onye ọtụtụ ndị ọ na-achị na-eme ngagharị iwe na-asị ya laba laba chụrụ mmadị iri abụ n'otu n'ime mmadụ iri abụọ na asaa sọ ya arụ ọrụ dịka minista. Ndị obodo Yukreni (Ukraine) onye ntụọchị amaama bụ Volodymyr Zelenskiy, e rigorotela akara onyeisi na ntuliaka ha, n'agbanyeghị na o nweghi ahumihe n'ihe gbasara ọchịchị obodo nke ọbụla. Ha akpọpụtachabeghi Volodymyr Zelenskiy ka onye meriri ntuliaka, mana a na-enyo ya enyo dịka onye nwereike imeri ntuliaka agba nke mbụ dịka mpụtra jiri zi. Ha sị na Volodymyr Zelenskiy na-eṅomi onyeisiala n'ihe onyoonyo anatala pacentị ntuliaka iri atọ na ọma (30.4%) ebe onye na-esote ya azụ bụ Petro Poroshenko nwetere 17.8%. Ha abụo ekwuoala maka isiokwu ndị EU ha bụ n'uche, ha akwadola imekwa ntuliaka nke ọnwa na-abịa. Gee nkeji BBC Igbo n'uju ebe a:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-47771423 +religion Ejike Mbaka: Ka onye e ji n'agbụ nwere onwe ya dịka Joseph "Ụkọchukwu ụka Katọlik bụ Father Ejike Mbaka ekpeela ekpere ka Chukwu tọhapụ ngwa ngwa onye ọbụla nọ n'agbụ nakwa na mkpọrọ. N'ozi ọ gbasara n'oge ọ na-eme ekpere 'Adoration ụbọchị taa Wenezde n'Enugwu, Fada Mbaka kpere ekpere ka amara mee n'isi nwaamadi ahụ dịka o mere n'isi Joseph n'Akwụkwọ Nsọ bụ onye o kwuru siri na mkpọrọ bụrụ eze. Mbaka akpọghị aha onye ọ na-ekwu maka ya mana ozi ahụ na-abịa ka ọ gachara otu abalị akụkọ gbara na Gọọmentị Naijiria nwụchirị ma kpụlata Naijiria NNamdi Kanu, onye ndu Ipob maka ebubo ịkpa nkata ikewa Naijiria. Ọ gara n'ihu tie n'oke olu, "" O! ndị iro m achịla m ọchị n'ihi na m ga-ekuli ọzọ."" Mbaka onye dọọ aka na ntị na ndị ndu Naijiria akpachaghị anya mee ihe ha kwesịrị ime na Naijiria nwere ike ịgbasa sịrị, ""Ịta ahụhụ abụrụla omenala na Naijiria."" ""Etu Naijiria si aga ugbua, oge na-abịa mgbe aga akpụrụwa ndị ụkọchukwu."" ""Gọọmentị Etiti kpụrụgodi mmadụ niile, ihe na ebe ka ga na- ebe."" ""Ndị ọchịchị were ego ha kwesiri iji nye ndị mmadụ ọrụ ka ha ji ego egbe."" "" Ndị kwesịrị ịnọ na mkpọrọ bụ ndị na-atụnye mmadụ na mkpọrọ."" Mbaka , onye kwuru na ya zịcha ozi ya, e nwere ike ịkpọ ya oku ọzọ bịa zara ọnụ ya kwuru sị, ""Ịmaja ndị mmadụ agaghị arụ ọrụ. Nnwuchi agaghị egbo nsogbu. Ọ ka mma na gọọmetị gere ndị mmadụ ntị. Enyela nkịta aha ka i were gbuo ya."" Ọ dọrọ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ aka na ntị sị, ""Ndị Gọvanọ ụnụ erela ụmụ n'ihi nkwa ọchịchị ụnụ amaghị ma ọ ga-enwe isi."" Cheta na Mbaka ekpeburola Nnamdi Kanu ekpere ngozi n'oge ọgbakọ ekpere ""Adoration"" ihe dịka izuụka isii gara aga. Ụka Katọlik mechara kwsịburu ọrụ dịka onye ndu ọgbakọ ekpere 'Adoration' abalị 30 'iji nye ya ohere ka ọ mee ntụghari uche na ekpere. Mana oge ndị na-eso ahụghị ya n'ọgbakọ ekepere izu ahụ, ha mere ngagharịiwe ma mebie ọtụtụ ihe n'ụlọụka 'Holy Ghost nakwa ụlọ Bishop Enugwu Katọlik bụ Calistus Onaga." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57673398 +health Birth Control: Etu ọgwụ 'contraceptives' si chọọ idula m mmụọ "Mgbe Vanessa Centeno chọpụtara na o nwere mkpụkọ ọbara na ngụgụ ya, ọ gbara ya gharịị. Mana oge ndịọrụ ahụike gwara ya ihe kpatara ụdị ihe a, ọ gbagwojuru ya anya karịa. N'afọ 2019, Vanessa bụ onye na-arụ ọrụ n'obodo Boston, malitere ịṅụ ọgwụ 'contraceptive' iji gbochie ịtụrụ ime. Nde kwuru nde ụmụnwaanyị na-ṅụ ọgwụ a n'akụkụ ụwa niile. Mana ọgwụ a kpatara ọbara mkpụkọ na ngụgụ Vanessa nke mere ka ndụ ya gbanwee kpamkpam. Vanessa kwuru sị: ""Ka m na-agbago elu otu ụbọchị, enwekwaghị m ike ikute ume nke ọma."" ""Ụdị ihe a emetubeghị m ebe m na-agba mbọ niile m nwere ike iji kute ume"" Mana Vanessa mechara gbalịa gaa ụlọọgwụ ebe e nyere ya ihe ga-enyere ya aka ikute ume. Nnyocha gosiri na e nwere ihe kpụkọrọ n'akụkụ ngụgụ ya, mana ha chere na ọ bụ 'pneumonia'. Mana ka otu ọnwa gachara, iku ume Vanessa kawanyere njọ nke mere ka e ziga ya na nnukwu ụlọọgwụ. Ebe ahụ ka nnyocha gosiri na ọbara kpụkọrọ na ngụgụ ya. Vanessa kwuru na dọkịta gwara ya na ""ihe kpatara ọbara mkpụkọ ahụ bụ ọgwụ 'contraceptive' m malitere ịṅụ n'ihi na onweghị ihe ọhụrụ ọzọ m tinyere n'ahụ m."" ""Ha gwara m na ọ bụrụ na chekwuru ka otu ụbọchị gafee tupu m bịa ụlọọgwụ, ihe gaara akawanye njọ."" Ọ na-ara ahụ tupu ihe dị otu a emee. Nnyocha nke ngalaba 'National Health Service' mere na mba UK gosiri na ọ bụ naanị ụmụnwaanyị iri na abụọ n'ime puku iri na-aṅụ ọgwụ 'contraceptive' nwere ike inwe ọbara mkpụkọ n'ime otu afọ. Ndị NHS nyere ndụmọdụ ka mmadụ jụọ dọkịta ya maka ihe ọbụla gbagwojuru ya anya. N'ụwa niile, ihe karịrị ụmụnwaanyị otu narị nde na iri ise (150 million) na-aṅụ ọgwụ 'contraceptive' iji gbochie afọ ime. Ọgwụ a nwere ike ime ka mmadụ buo ibu, maọbụ metụta ọnọdụ echiche mmadụ, mana o nwekwara ike ịkpatara ụfọdụ ọbara mkpụkọ nke nwere ike idula mmadụ mmụọ. Ọkammụta Beverly Hunt nke ụlọọgwụ Guy's and St Thomas' Hospital dị na London kwuru na mmadụ ịṅụkọ ụdị ọgwụ 'contraceptive' abụọ ọnụ nwere ike ịkpata ọbara mkpụkọ. Mkpụrụọgwụ 'contraceptive' na-enwe ụdị akụrụngwa 'oestrogen' maọbụ 'progesterone' bụ nke ahụ mmadụ na-emepụtakwa. Ọ bụ akụrụngwa ndị a na-ezigara ụbụrụ ozi iji gbochie ahụ nwaanyị iyipụta akwa nke na-eme ka ọ tụrụ ime. Mkpụrụọgwụ ndị a nwereike ịkpatara nwaanyị ịgbọ agbọ, ibu oke ibu, ihe ntukasị n'ihu nke a kpọrọ 'pimple', dịrị gawazie. Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ekwu na ọ na-akpatakwara ha isi ọwụwa, anaghị achọ inwe mmekọ ahụ (low libido), ara ịfụ ụfụ na ihe ndị ọzọ. Mana Dọkịta Zozo Nene nke ụlọọgwụ Steve Biko dị na Saụt Afrịka kwuru na ọbara mkpụkọ na-emekarị n'ụmụnwaanyị buru ibu. Otu afọ agaala kamgbe Vannessa nwechara ọbara mkpụkọ na ngụgụ ya n'ihi ọgwụ 'contraceptive', mana o kwuru na egwu ka ji ya aka. ""Aṅụrụ m ọgwụ ọnwa isii ma na-akpachapụkwa anya n'ihe ọbụla m na-eme iji gbochie ịgba ọbara n'ime ahụ m,"" Vanessa na-ekwu. ""Oge ọbụla m chọrọ ịsa akwa, ụjọ ga-ejide m ka a ga-asị na okuku ume m ọ chọwala ịkwụsị ọzọ.: ""Mana ana m echetara onwe m oge niile na ahụ esiela m ike ugbua."" Vanessa gara n'ihu kwuo na ụwa nwaanyị adịghị mfe ma ncha n'ihi ọtụtụ ihe ha na-agabiga n'ahụ ha. ""Anyị na-anọ na nsọ kwa ọnwa ọbụla, ahụ mgbu oge niile, ma burukwa ya na-arụ ọrụ dị icheiche."" ""Ọ bụrụ na i kwuo okwu, ndị mmadụ ga-ele gị anya dịka onye umengwụ. Ha ga-agwa gị sị, 'ihe a ekwesịla ịmata gị ahụ ugbua."" Ekwesịrị ịchọpụta ụzọ a ga-eji mee ka ihe ndị a dịwanyere anyị mfe. ọ bụ eziokwu na ha ga-abịarịrị mana e kwesịrị ime ya ka ọ dịrị anyị mfe ma kawanyere anyị mma.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-55862096 +entertainment Zicsaloma: Ọ dịghịrị m mfe ime ka ndị mmadụ kiriwe ihe ejije m mgbe m bidoro Ị maara okorọbia ahụ na-eme ejije ka nwaanyị? Isaac Aloma Junior (e ji Zicsaloma mara na soshal midia) gwara BBC Igbo ka o si malite ime ihe ejije ka ọ gụchara akwụkwọ ịbụ okaikpe nakwa asụsụ Englishi na Mahadum. Ọ sị na akanchawa ya bidoro mgbe o malitere ịme ihe onyonyo. Isaac sị na ihe kacha taa ya akpụ bụ ịme ka ndị mmadụ malite ikiri ihe ọ na-eme. Kirie ka o si mezie ya bụ ihe tara ya akpụ. Ndị mere akụkọ a: Chioma Nkemdilim, Vining Ogu na Nnamdi Agbanelo. https://www.bbc.com/igbo/afirika-57625390 +entertainment Pete Edochie: Ịga 'honeymoon' na ihe ndị ọzọ a mụtara n'aka ndị ọcha Ọlụlụ di na nwunye bụ ihe dị oke mkpa na ndụ ndị mmadụ n'agbanyeghi agbụrụ ndị ahụ si. Mana agbụrụ ọbụla nwere usoro dị iche iche ha ji eme emume ọlụlụ di na nwunye nke ha. Igbo nwere omenala pụrụiche n'ihe banyere ọlụlụ di na nwunye mana ọ dịka a ga-asị na ha akụrụla ụfọdụ omenala ndị ọcha. Ngwa ka anyị tụlee ụfọdụ omenala ndị ọcha a nke ndị Igbo ṅomiri. Nke a bụ omenala ọgbara ọhụrụ na-arị ibe ya elu ugbua n'ọlụlụ di na nwunye bụ nke na-adịghị n'ala Igbo n'oge mbụ. O so na omenala ndị e ṅomiri n'aka ndị ọcha nke ọtụtụ ndị ọdịnala Igbo dịka Pete Edochie katọrọla ọtụtụ oge. Pete Edochie hụtara ya dịka nwoke ị gbara nwaanyị ohu. Ọ sị na omenala Igbo anabataghị nwoke isekpuru ala arịọ nwaanyị ọlụlụ. Mana e nwere ọtụtụ mmadụ karịsịa ụmụnwaanyị sị na nwoke isepkuru ala arịọ nwaanyị ọlụlụ gosiri ụdị ịhụnanya o nwere n'ebe nwoke ahụ nọ. Ịgbanye ọla aka Itinye ọla n'aka dịka a na-ahụta ugbua abụghị njirimara ndị Igbo n'ihe banyere alụm di na nwunye. O sokwa n'otu ihe ndị a mụtara n'aka ndị ọcha bụ nke a ga-asị zuru Igbo ọnụ ugbua. N'agbanyeghi na o nwere ụfọdụ ihe Igbo ji egosipụta nwoke maọbụ nwaanyị lụrụla nwunye maọbụ di mana ọ bụghị ịgbanye ọla aka. Ụfọdụ ihe ndị a gụnyere nwaanyị ịma ukwu akwa abụọ, ịgbanye ọla olu nakwa ụfọdụ akara dị iche iche. Ịgba akwụkwọ n'ụlọụka nakwa n'ụlọikpe Ndị a bụ omenala alụm di na nwunye e ji mara ndị ọcha nke ọtụtụ ndị mmadụ na-agbakwunye n'omenala ha bụ. Omenala nke e ji mara ndị Igbo bụ ịgbankwụ a kpọrọ 'Traditional Marriage' nke gụnyere ịkwụ ụgbọ isi nwaanyị na ihe ndị ọzọ so ya. Ọ bụrụ na a gbaghị nkwụ nwaanyị nke ahụ pụtara na a lụghị nwaanyị ahụ alụ. Mana ụfọdụ ndị ụka Kraịst na-etinyere nke ha ịgba akwụkwọ n'ụlọụka ebe ụfọdụ na-agba akwụkwọ n'ụlọikpe. Emume 'Bachelor's Eve' Nke a bụ emume a na-eme iji nye nwoke okokporo ohere ka o mee ihe ndị ahụ nwunye ya nwereike agaghị anabata ma ọ lụọ ya. Ọ bụ ohere nwoke a na ndị enyi ya nwoke ga-anọkọ ọnụ, rie oriri, ṅụọ mmanya, tee egwu nakwa ihe ndị ọzọ. Nke a esoghi n'omenala Igbo n'ọlụlụ di na nwunye mana ọtụtụ ndị na-emezi ya ugbua. Mana e nwere ndị sị na ọ bụ ụzọ ọzọ e ji atụfu ego n'ọlụlụ di na nwunye. Ezumike 'Honeymoon' Nke a bụ ezumike di na nwunye lụrụ ọhụrụ na-enye onwe ngwa ngwa ha lụchara. Ụfọdụ di na nwunye na-aga ebe dịka ụlọ ndina, ụlọ oriri na nkwari ogogo ha dị elu gụnyere ndị nọ n'ofesi n'oge ezumike a. A bịa n'omenala ọlụlụ di na nwunye n'ala Igbo, onweghi ihe dịka ezumike n'ụdị a akpọrọ 'honeymoon' mana ugbua a na-emezi ya. N'oge mbụ, ọ bụrụ na di na nwunye gbacha nkwụ taa, echi ha abụọ nwereike itinye isi n'ọrụ ugbo bụ ọrụ dị n'oge ahụ. N'agbanyeghi etu omenala ọgbara ọhụrụ ndị a ji arị elu n'ala Igbo, e nwere ndị ka ji omenala Igbo hiwe isi. Ndị a ka na-agbaso omenala e ji mara ndị Igbo n'okwu banyere ọlụlụ di na nwunye, na-etinyeghi ya nnu maọbụ ose. Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51583156 +business Enugu state news: 'Anyị atụtụtaghị otu mkpụrụ ihe n'ọkụ gbara n'ahịa Afor Iwollo Oghe' "Ndị na-azụ ahịa n’Afor Iwollo Oghe dị n’okpuruọchịchị Ezeagu nke Enugwu steeti akpọola oku ka a gbatara ha ọsọ enyemaka dịka ọkụ gbara ihe ruru ụlọahịa iri abụọ (20) ọkụ ebe ahụ n’ụtụtụ Satọde, abalị abụọ nke ọnwa Ọktoba. Ụfọdụ ndị ahịa ahụ gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo okwu, kwuru sị na ha atụtụtanwughi otu mkpụrụ ihe n’ime ọkụ ahụ malitere ịgba ebe elekere abụọ nke isi ụtụtụ. Oriakụ Caroline Onyigbo kọwara etu ya na ụmụ ya si jiri ndụ ha pụta na ya bụ ọkụ. O kwuru sị ""Mụ na ụmụ m nọ na-arahụ ụra mgbe isi anwụrụ kpọtere anyị. Mgbe m mepere ụzọ m hụ na ọnụ ụlọahịa m na-agba ọkụ, m wee tiwe mkpu ma kpọrọ ụmụ m gbapụ ezi. Nkeji ole na ole gara ebe anyị na-eti mkpu enyemaka, mana enweghi onye bịakwutere anyị dịka ọkụ ahụ malitere ịgbapịa ụlọahịa ndị ọzọ."" Oriakụ Blessing Ezi kwuru sị na ya na di ya bịawara ozugbo ha natara ozi na ọkụ na-agba ebe elekere abụọ nke isi ụtụtụ a. Ezi na-ere ọgwụ na ihe ntecha kwuru na enweghi otu mkpụrụ ihe ha tụtụtara n'ime ọnụ ụlọahịa ya. O kwukwara na ọ bụ n'ọnụ ụlọahịa nke ya ka ụfọdụ ụmụntorobịa gbatara ọsọ enyemaka nọ menyụọ ya bụ ọkụ ma kwụsị ya ịgbapịakwu ọnụ ụlọahịa ndị ọzọ. Ruo ugbua, amabeghi ihe kpatara ọkụ ọgbụgba a. Ndị na-azụ ahịa ebe ahụ kpọkuru gọọmentị Enugwu steeti nakwa nke okpuruọchịchị Ezeagụ ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka n'ihi na ọ bụ ebe ahụ ka ha si eri nri ma na-elekọta onwe ha. Gere ihe ha kwuru n'uju:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-58769678 +entertainment Banga Soup: 'Emele m ka ọ dị gị mfe isi ofe akwụ na nkeji 20' Akwụ bu otu n'ime ihe e ji esi nri n'ala Igbo ọkachasị, ofe akwụ. Mana, ụfọdụ usoro e ji emedo ya bụ mmanụ ndị mba mmiri na-akpọ banga (palm nut oil) na-ahịaahụ. Ọ bụ ihe a mere ka Udoka Ugwu malite imepute nkwa nri akwu e ji ete ofe akwụ ịme ka ọ dịịrị ndị mmadụ nfe. Odoziakụ Ugwu na-agbanye akwụ a n'ime akpa tupu o ree ya. Ọ bu oge mmachi ngagharị n'afọ 2021 ka ọ malitere njem a iji nwete obele ego dịka ọ dị ime n'oge ahụ. Kiri akụkọ ya n'uju. https://www.bbc.com/igbo/afirika-56411311 +entertainment Nigerian Weddings: 'Enweghị ihe m ji nwaanyị Naịjiria eme kemgbe m nụchara ụtọ nwaanyị ọcha a' "Isa Sulaiman Panshekara dị afọ 26 chọrọ ịlụ Janine Sanchez bụ nwaanyị Amerịka dị afọ 46 gwara BBC na o nweghi ike ịhụ nwaanyị Naịjirịa n'anya ka ọ nụchara ụtọ nwaanyị a. Gịnị kpatara nke a? ""Eziokwu bụ na ụmụnwaanyị anyị amaghị ihe bụ ezigbo ịhụnanya, ma ọ bụghị na ha na-achọ ihe n'aka gị, ọ bụrụ na ogbu oge nwere 'plan'. Mana nwaanyị onye ọcha gwa gị na ọ hụrụ gị n'anya, nwanne, o si ya n'ala ala obi."" Isa bụbụ ọkpụisi kwuru na obere ụjọ bara ya ahụ mgbe ndị Hisbah na ndị ọrụ nchekwa DSS kpọtara ya n'ụlọọrụ ha, mana ọ garuru ọ bụrụ ndụmọdụ ka ha nyere ya n'ihi etu ndị ntaakụkọ si ebugharị akụkọ ya. Isa na Janine zutere onwe ha n'Instagram ebe otu afọ gara aga. ""Anyị zutere mgbe m malitere iso ya n'elu Instagram, o tinye foto ya m binye ya aka mmasị m. Mgbe obere oge gatụrụ, m bịa hụ na ụfọdụ ndị a na-eme 'Yahoo yahoo' na-achọ igwu ya chandum, m bịa zigara ya ozi sị ya gbachikwa ndị ahụ nkịtị. ""Nke ahụ abịa mee ya ka ọ hụ na mbụ onye buuru ya ihe ọma n'obi. Ọ bụ nke a mere ka ọ malite inwe mmasị ebe m nọ mgbe ahụ. ""Anyị si ebe ahụ malite ịkpa ọfụma, na-akpa nkata site n'onyonyo nke ekwentị. Nke ahụ niile kpọtara anyị ebe anyị nọ ugbua."" Ịza ajụjụ a jụrụ ya ma ha abụọ ehiela n'otu imeụlọ kemgbe Janine chọrọ ya bịa Kano ụbọchị isii gara aga, o kwuru sị: ""Anyị anaghị araghụ n'otu imeụlọ, mụ na ya na-anọgide chi ejie tupu m sị ya ka chi foo. Naanị nke obere a anyị na-eme (ịmakụ onwe anyị na ijide aka) ndị mmadụ na-ekwu okwu ka ọ fọdụzịa ịlaba n'otu imeụlọ."" Isa kwuru na ezinaụlọ ya ekwetela ka ọ lụọ Janine, nke bụ na ha ga-agba akwụkwọ na Maachị afọ 2020 a, tupu ya na nwunye ya akwakọrọ lawa mba Amerịka. ""Anyị gbachaa akwụkwọ n'ọnwa Maachị site n'amara Chineke, anyị ga-ala mba Amerịka ebe m ga-achọta ọrụ, laghachị ụlọakwụkwọ, makana m kwụsịrị na sekọndrị. Ebukwa m n'obi ịchọta otu egwuregwu m ga na-agbara."" Janine na onwe ya kwuru sị na ọ bụ mbụ ya ịbịa Afrịka, ma kwuo na obi dị ya ụtọ maka etu ndị mmadụ si eleta ya. O kwukwara sị: ""Ezutela m ihe karịrị mmadụ 100 n'ime ezinaụlọ ya, obi na-atọ m pọlịna pọlina na ha niile ekwekọrịtala ka anyị lụọ. Ọtụtụ n'ime ha ahụtụbeghi nwaanyị ọcha, ha bịara na-emetụ ntutu m aka, na-ejide m aka."" Janine bụ osiite na Kalifonịa sị na ọ na-alaghachị Amerịka na Febụwarị tupu ọ lọghachị na Maachị maka agbamakwụkwọ ya. ""M na-alaghachị azụ n'ọnwa na-abịa, m ga-alọghachịte na Maachị maka agbamakwụkwọ anyị tupu mụ na ya akwakọrọ laghachi Amerịka."" Na ngwụcha, Isa sị na ịhụnanya ya na Janine gosiri na ịhụnanya ziri ezi ka dị n'elu soshal midia, ma gwa ndị mmadụ gaa nwaa ike ha. Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51186866 +sports Ụkwụ Neymar rọjiri akụpụla ya n'asọmpi na-abịa Neymar da Silva Santos bụ onye egwuregwu bọọlụ otu Paris St-Germain agaghị eso n'asọmụnpị Paris St-Germain na Real Madrid n'iko Champions League maka omerụrụ ahụ n'ụkwụ. Neymar dị afọ iri abụọ na isii merụrụ ahu n'ogweụkwụ n'ụbọchị ụka n'asọmpị Paris St-Germain na Marseille. Ndị dokinta ekwubeghị oge Neymar ga-agbake. Neymar ba otu PSG n'ọnwa August n'afọ 2017, o nyere goolu ruru iri abụọ na itoolu n'ime asọmpị iri atọ. Ugbua PSG ji akara iri anọ karị Monaco. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43208185 +politics Anambra: Okwu a akarịala gọọmenti ọwụwaanyanwụ Buhari tinye 'State of emergency' - Joe Igbokwe "Joe Igbokwe bụ onye enyemaka Gọvanọ Lagọs steetị n'ịdịọcha obodo nakwa ezigbo onye otu Bola Ahmed Tinubu, onyeisi ndị All Progressive Congress (APC) gwara gọọmentị etiti ka ha tinye ọnọdụ gbata gbata n'alaigbo nille gbaa gburugburu maka ọnọdụ enweghị nchekwa dị na-ebe ahụ. Igbokwe sị na ihe na-eme n'ala Igbo ugbua bụ ihe ha na-akọpị n'ugwuawụsa. Ọ sị, ""Ọ bụghị naanị n'Anambra steetị ka e kwesiri ịme ya, ọ bụ n'ala Igbo niile maka na e jide ha (ndị ekperịma) na steeti a, ha agbafere n'ọzọ. Ihe na-eme ebe ahụ ugbua bụzị ịchụntaego"". Maka onye omeiwu Anambra steeti bụ Okechukwu Okoye, e gburu, Igbokwe sị na ya bụ ihe jọgburu udele sigbuoa nkakwụ N'okwu ya, ọ sị ""ndị ahụ mere arụ"". Ọ chetere ka ndị omekome n'ala Igbo siri gbaa ụlọ ya na ụlọ ndị ọzọ ọkụ nakwa ka e siri gbuo ndị agha, di na nwunye na nso nso a. O kwukwara okwu maka ajọ ihe niile ndị ajọ mmadụ a mere sị na ndị ahụ e meruola ala Igbo. ""Anụ gbaa ajọ ọsọ, agba ya ajọ egbe"". O kwuru na ọtụtụ ajọ ihe ka ga-eme n'ọdị n'ihu. Ọ sị na Chukwuma Solodu bụ Gọvanọ Anambra steeti kwesiri ịọ ga-zuoike uigbua rụọ mgbe ndị agha meminachara ndị ajọ mmadụ a., maka na ndị gọvano enweghị ike n'aka ndị uweojii maọbụ ndị agha," https://www.bbc.com/igbo/afirika-61557610 +business Natural Resources: Imo State na ihe akụ ọnatarachi juputara n'ime ya Imo steeti so na steeti na-emepụta mmanụ agbịdị na Naịjirịa. Ụmị mmanụ agbịdị dị n'Imo steeti karịrị otu narị na iri isii. Ụmị ndị dị n'obodo iri na abụọ na steeti ahụ Mana ọ bụghị naanị mmanụ agbidi bụ ihe akụ ọnatarachi dị na steeti ahụ. Lee ndị ọzọ ebe a dịka nchọpụta ngalaba 'Raw Materials Research & Development Council' si kwuo. Zinc bụ ụdị igwe e si n'ala egwupụta. Chaịna, Peru nakwa Ọstrelia bụ mba ndị e ji mmepụta 'zinc' mara. Ọ na-enye aka na mmepụta ọkụ latrik. A gwakọọ 'zinc' na 'copper', e nweta 'brass'. E nwekwara 'zinc' nke na-edozi ahụ. Ihe ndị ọọ e ji 'zinc' emepụta bụ rọba, mmanụ e ji ete ụlọ (paint), na kemịkalụ ụfọdụ. Na mpaghara ụfọdụ n'Okigwe na Orlu ka e nwere 'zinc' n'uju. Gypsum bụ ụdị nkume e si n'ala egwupụta. Ihe e ji ya arụpụta gụnyere nzu bekee a kpọrọ 'chalk', ọgwụ, nakwa 'Plaster of Paris' (POP). E jikwa ya eme ka ala kawanye mma iji kọọ ihe. Ebe ị ga-ahụ 'Gypsum' bụ n'Okigwe. Otu ihe kacha mkpa e ji 'lead' emepụta bụ 'battery'. 'Battery' bụ ihe na-enye ụgbọala, ọgbatumtum, ekwentị na ihe ndị ọzọ ike. E jikwa lead emepụta igwe na ihe ndị ọzọ. Okigwe na Orlu nwere 'lead' n'uju. Ihe e ji 'limestone' arụpụta buru ibu. Ha gụnyere 'cement', 'ceramics' na ihe ndị ọzọ. 'Limestone' na-aka mfe igwupụta karịa nkume ndị ọzọ. Ebe e nwere ya n'Imo Steeti bụ na mpaghara Ohaji-Egbema na Okigwe. 'Kaolin' bụ ụdị nkume ọcha na-akwọ mụrụmụụ. E ji ya emepụta nke Bekee kpọrọ 'ceramics', werekwa ya arụ ọgwụ na-akwụsị otoro maọbụ afọ ọsịsa. Kaolin dị n'Ehime Mbanọ, Isu nakwa Oru North. Lignite bụ ụdị 'coal'. Mana ọnaghị eji uji nke ukwu dịka 'coal' ndị ọzọ. A naghị ejikarị 'lignite' akwọ ụgbọ oloko (train). Ebe ọ na-aka egbo mkpa bụ na mmepụta ọkụ latrik. 'Lignite' dị n'akụkụ ụfọdụ n'Orlu'. Na mpaghara Ideato South nakwa Isu ka e nwere 'bentonite'. Nke a bụ ụdị aja ụrọ na acha ọcha. Ọ na-enye aka n'igwu ụmị dị icheiche dịka ụmị mmiri nke Bkee kpọrọ 'Borehole'. Ọrụ ya bụ igbochi mmiri ịba ebe achọghị ka ọ baa. Obodo dị icheiche n'Imo Steeti nwere ọtụtụ emume ọdịnala mara mma nke ukwu. Ọ bụrụ na e lebaa emume ndị anya ma mezie ya nke ọma, ọ ga-adọta ndị mmadụ ka ha na-abịa njem nlereanya na steeti ahụ. Bịa tinyekwara oshimiri Ugwuta nke a na-akpọ 'Oguta Lake' na Bekee. Ụdị ihe a bụ ihe na-amasị ndị njem nke ukwu. Imo bụkwa steeti ala ya na-emepụta nri nke ọma. Naanị nkọpụta nri, ma e mezie ya ọfụma, nwere ike inye gọọmentị Imo nnukwu ego. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50202766 +health Porn Addiction: Lee ihe o nwereike ibutere gị "N'afọ 2016 ka onye na-eme ihe ejije ama ama bụ Terry Crews kọwara etu ihe onyonyo aramara bụ siri baa ya n'ọbara ma bụrụ nsogbu nye ya. Bekee na-akpọ ọnọdụ nke a Maazị Crews hụrụ onwe ya ""Pornography Addiction"". Okwu ahụ o kwuru mere ka ọtụtụ ndị mmadụ kwuputa etu ha na ihe aramara onyonyo si agba mgba. Ndị ntaakụkọ BBC kọwara na ihe dịka ndị mba Briten mmadụ nde iri na ise lere ihe onyonyo a site n'ọnwa Sepụtemba afọ 2020 ruo ọnwa Jun afọ 2021. A bịa na Naijirịa, ndị na-ekiri ihe aramara ka nkụ. Otu websait na-eme ihe onyonyo aramara a kpọrọ PornHub kọwara na Naijirịa kachasị na ndị na-achọ ihe onyonyo aramara ụmụ nwaanyị buru ibu. Dịka PornHub siri kwuo, Naịjirịa nọ n'elu mba 25 kachasị ekiri onyonyo aramara na-egosi ụmụ nwaanyị buru ibu na mba ụwa. Ọ bụghị sọsọ aramara nwere ụmụnwaanyị buru ibu ka nchọpụta na-egosi ka na-amasị ndị Naịjirịa. Na-agbanyeghị na Naịjirịa na-agbarụrụ mmekọ nwoke na nwoke maọbụ mmekọ nwaanyị na nwaanyị, n'afọ 2016, Google dere na mba ahụ so n'ebe kachasị ekiri atụmatụ Bekee kpọrọ ""Gay Porn"". Nke a pụtara na ọtụtụ mmadụ na mba ahụ, dịka n'ụwa dum, na-ekiri ụdịrị onyonyo a. Mana, dịka ụfọdụ nwere ike kirie ya gara onwe ha ihu na-enweghị nsogbu ọbụla, o nwere ndị ọ na-arịa ahụ ịhapụ ha - maọbụ ndị adịghị anọnwụ ma ya bụrụ na ha ekirighi ya. Dịka Maazị Crews, Maazị Adeniyi Adebola Atiba nwekara nsogbu site n'etu o siri na-ekiri ụdịrị onyonyo a. Ọ sị na ihe onyonyo aramara chere ya ezigbo aka mgba. Ugbua, ọ bụzị onye na-adụ ndị mmadụ ndụmọdụ maka nsogbu dị iche iche nke gụnyere maka ihe onyonyo aramara ọkachasị Porn Addiction. Atiba kọwara na ọ bụ maka na ọ na-anọkarị onwe ya nke Bekee na-akpọ ""loneliness"" soro kpata ya ile ihe onyonyo aramara. O kwuru sị, ""Dịka onye na-arụ ọrụ gbasara ịntanetị, ị nwereike na-arụ ọrụ n'oge abalị ihe gbasara pornography etipụta isi ka ị nyochaa ya"". O kwukwara na ọ bụ n'akwụkwọ nwere ihe aramara n'ime ya ka o siri bido banyezia na nke nkịrị. Atiba kwuru, ""Ọ bụ ụfọdụ akụko anyị na-agụ oge anyị pere mpe soro bido ọnwụnwa ilele ihe aramara"". O kwuru na dịka onye toro n'ụlọụka, na onweghị ihe ọ ma maka mmekọ nwoke na nwaanyị. Atiba kwuru maka na enweghị onye guziri ya maka mmekọ nwoke na nwaanyị so na ihe mere o jiri bido ikiri ihe onyonyo aramara. Adeniyi Adebola Atiba kwuru na Porn addiction mere na ọ bụrụ na ya eleghị ihe aramara maọbụ gbọọ ncha na ọ nweghị ike ịche uche nke ọma. Lee ụfọdụ ihe o kwuru na-eso Porn Addiction : Oke ịgbọ ncha (Masturbation) Adeniyi kọwara na ile ihe onyonyo aramara mere ka o bido gbọwa ncha. Ọ kọwara, ""ịleecha ihe onyonyo aramara ị ga-achọ ụzọ ị ga-esi nwereonwe gị nke ga-ebute oke ịgbọ ncha"". O kwuru na ya bụ ihe ga-adịzị ka usoro nke bụ onye leecha ihe onyonyo a, ọ chọwa ịgbọ ncha. Obi Amamikpe Dịka m bụ onye na-eziza oziọma n'ụka, ihe aramara mere ka obi na-ama m ikpe mgbe ọbụla m chọrọ ịrụ ọrụ oziọma. O kwuru sị, "" Ọ bụ ibu arụ dịịrị m, nke mere na ụfọdụ mgbe m na-atule ịkwụsị ọrụ oziọma n'ụka"". Obi Ịdamba (Depression) Atiba kwuru sị, ""ịkwu eziokwu, ọ mere ka obi daa m mba"". Ọ kọwara na mgbe ọbụla ọ chetara etu ihe aramara sị echere ya aka mgba na obi na-ada ya mba. Ike okpụkpe ịgwụ mmadụ O kọwara na nke a mere ka ọ kwụsị ịkpere Chi ya ekpere. O kwuru sị,"" Ọ mere ka m chere na m adịghị ọcha nke mere na ọ naghị ekwe m kpee ekpere"". Atiba kwuru na mgbe mmadụ na akacha amata na ihe onyonyo aramara abanyela ya n'ọbara bụ mgbe ọ nweghịike ịkwụsị ile ya. Ọ kọwara sị, ""ọ bụ ijị aka gị bido ihe kama ịnweghịzị ike ịkwụsị ya"". Ihe ọbụla dị etu a na-ejisi ndụ mmadụ ike. ""Etu m sịrị merie Porn Addiction"" - Adeniyi Adebola Atiba Adeniyi Adebola Atiba kwuru sị, ""Porn addiction na-eme ka onye na aṅụ ọgwụ ike"". Atiba kwuru na ọ bụ dịka ọ chọrọ ịlụ nwaanyị were kọọrọ nwunye ya ka njem mmeri ya siri bido. O kwuru sị, ""A gwara m nwunye m nsogbu Porn addiction m nwere, ọ nyere m aka nke ụkwụ. Ọ hụrụ na m anaghị anọ naani m mgbe niile ma na-akpọtụrụ m ọtụtụ mgbe"". O kwukwara na ihe ndị dị mkpa mmadụ kwesịrị ịme iji merie porn addiction bụ: Kedụ ihe ndị Nne na Nna ga-eme iji gbochie ụmụ ha ịbanye n'aka Porn Addiction? Adeniyi Adebola Atiba kwuru sị, ""Ọ dị mkpa ka nne na nna hapụ izoro ụmụ ha ihe gbasara ahụ nwoke na nwaanyị, na ihe gbasakwara mmekọ nwoke na nwaanyị"". Ndụmọdụ Atiba nyere ha gụnyere - Ihe ndị nnyocha ọkaibe sayensi na-ekwu Lee ihe Robert Hudson onye bụ ọkaibe na nyocha maka ndị aramara bara n'ụmị nke bụ ""Sex addiction"" na bekee kwuru maka nsogbu Porn addiction. Hudson kwuru sị,"" ịle ihe onyonyo aramara abụghị nsogbu. Ọ dịka ịṅụ mmanya. Ụfọdụ nwereike ịṅụ mmanya etu ha kwesịrị"". O kwuru sị,"" Mgbe ihe onyonyo aramara bụ nsogbu bụ mgbe ya bụ ihe wegharịrị ọnọdụ chịwazie na ndụ onye ahụ"". Hudson gara n'ihu kwuo, "" Ihe onyonyo aramara aghọọla nsogbu mgbe onye ahụ bidoro hapụ mmekọ ndị mmadụ dịka ọ na-achọ ohere ka ọ kịrịe ihe aramara"". O kwuru na ihe mbụ ha na-agwa ndị nwere nsogbu Porn Addiction bụ ka ha kwụsị ịgbọ ncha ọnwa atọ nke ga-eme ka ha nweta onwe ha ma kwụsị ịle ihe onyonyo aramara. Hudson kọwara sị, ""Nke a abụghị na a gwọọla gị kama ọ bụ ihe ngosi na ịnwereike ibi ndụ gị ma ịleghị ihe onyonyo aramara""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57983386 +politics Akụkọ kachasị n'abalị a: Ohaneze na Ipob onye tinye mma ya n'ọbọ Ipob gwara ndị otu ha deere duu Ụkọchukwu Peace, bụ otu n'ime ọnụ na-ekwuchiri otu Ipob kwuru na ha na Ohaneze Ndịgbo nọ na ọnọdụ onye tinye mma ya n'ọbọ ugbua. Peace kwuru nke a mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ ka akụkọ pụtara na udiri ihe ahụ na-eme. Idere mmiri na anịozize egbuola ọtụtụ mmadụ na Hiroshima, Japan Ide mmiri na ala ozize egbuola ọtụtụ mmadụ n'obodo Hiroshima nke mba Japan. Ihe mberede a mere ka gọọment mba ahụ nye iwu ka mmadụ ruru otu nde na narị ise (1,500,000) kwapụ ebe ha be. Agwakwara mmadụ nde atọ ọzọ na ọkakwara ha mma iji ehihi chọwa ewu ojiri. MKO Abiola nwuru udi mgbe a na 1198] Tata ka onye a na-eche na ọ bụ ya meriri na ntuliaka nke 1993 bụ MKO Abiola nwuru. Abiola nwuru na nga na afọ 1998. Nwafọ Ọnụ a eru na-okwu bụ Micheal Chimezie Nnabuchi gwara BBC IGBO na Abiola bu mmadụ oha, bukwara onye ndị mmadụ binyere aka agbanyeghị ebe ha sị. N'egwuruegwu Iko mbaụwa Ingland ataala isi Swiden Na iko mbaụwa, Ingland ji ọkpụrụkpụ ọkpa gbakacha Swidin ahụ. Maguire na Alli bụ ndi sukara net ndi Swiden na nkeji iri atọ nakwa nkeji iri ise na asaa n'ime asọmpị ahu Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Lee ihe nkiri anyị https://www.bbc.com/igbo/afirika-44743611 +health Coronavirus in Nigeria: Ihe mere o ji dị mkpa ime nnyocha maka coronavirus Ihe onyonyo a na-egosi usoro na ụzọ dị iche iche esi enyocha maka ọrịa coronavirus. Ọ ga-ekuziri gị ihe mere o ji dị mkpa na ị mere nnyocha ma ọ bụrụ na ị na-egosipụta njirimara ya bụ ọrịa. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52693778 +business Etu anyị si mepụta akwa 'Goddess Drip' na-ewu ebe niile. Udoaku Eze na Chigozie Ndubuisi bụ ụmụagbọhọ abụọ na-emesi ihe ike n’ihe gbasara ịchepụta na ịmepụta akwa. Ha gwara BBC Igbo na ha bidoro ịnwe mmasị maka akwa kamgbe ha bụ ụmụakwụkwọ. Ụlọọrụ ha aha ya bụ ‘Udoaku’ akwaala akwa nke ọtụtụ ndị ama ama nke gụnyere Toke Makinwa, Moet Abebe na Linda Ikeji yirila uwe ha. Ha kọwara BBC Igbo etu ha siri site n’azụụlọ ha ma nwee ụlọọrụ ha na-emepụịta akwa ha ugbua nke dị n’Abuja. Ha kwukwara maka etu akwa ha chepụtara ma mepụta nke a kpọrọ ‘Goddess Drip” siri gazuo ebe niile kama enweghị onye ma na ọ bụ ha mere ya. Kirie akụkọ ha n’uju ebe a. https://www.bbc.com/igbo/articles/cn0z06dr2nzo +sports Chelsea vs West Ham: A kpọọla Chelsea ntu n'isi na be ha Obi na-agbawa ndị na-akwado Chelsea ugbua maka etu ndị West Ham ji were ha gbụchara ọnụ. Goolu Aaron Cresswell nyere n'ime nkeji 48, zuru ịkpọnye ntu n'obi nakwa n'akpati ndị Chelsea, makana ha asatanwughi otu mkpụrụ goolu ahụ. Na nkeji 71, a gụfuru goolu Michail Antonio nyere, dịka e kwuru na aka metụrụ ya. Ndị Chelsea gbara elu gbaa ala, mana isi ha apụtaghị n'agbanyeghi nkeji ise e tinyekwuru n'egwuregwu ahụ a gbara na Stamford Bridge. Nke a bụkwanụ mmeri mbụ West Ham na-emeri Chelsea na Stamford Bridge n'ime afọ 17. Chelsea ga-ezute Aston Villa n'ụbọchị anọ nke Disemba, ma zutekwa Everton n'ụbọchị asaa nke ọnwa ahụ. Man City a na-akwọzị mmiri ka azụ? Ndị Newcastle enyeghi Manchester City ohere imebọ ha n'ọgbọegwuregwu St James Park ka ha lere ha ọbịa taa. Ha ji goolu na-asa onwe ha okwu, ghara imenye onwe ha ihere n'azụ ụlọ ha ka ndị Man City buteere ha egwu. N'ime nkeji 22 e ji bido bọọlụ ka Raheem Sterling gbakara neetị Martin Dubravka, mana Jetro Willems sara ya na nkeji 25 iji sị ha 'kwanyere onwe ha ugwu o'. Man City megidere nweta goolu ọzọ na nkeji 82, site n'aka Kevin De Bruyne, mana Jonjo Shelvey sara ya na nkeji 88, iji sị ha 'gbara ọgwụ ha ṅụọ'. Onye lawa onye lawa ha gbatara, mere ka Man City nweta otu pọịntị n'ime atọ; ma mee ka ha nọrọ na pọịntị 29. Nke a mere ka Liverpool bụ ndị ha na ha na-azọ onye ga-anọ n'isi tebulu, jiri pọịntị 11 na-aga ha ugbua. Ha ga-ezute Burnley n'ụbọchị atọ nke ọnwa Disemba, ma zute oke iro ha bụ Manchester United n'ụbọchị asaa. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50565495 +politics Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ipob enyela gọọmenti iwu maka Abaribe Akụkọ dị mkpa Ipob enyela gọọmentị etiti ụbọchị abụọ ka ha tọghapụ Sịnetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye ndị nchekwa DSS nwuchiri abalị atọ gara aga ma ọ bụ ha gosipụta iwe ha. Onye ode akwụwkọ ha bụ Emma Powerful kwuru na gọọmentị ekwubeghị eziokwu ihe ha jiri nwụchie Sịnetọ a. Buhari Arịọla ka-eme udo na Plateau Steeti Onyeisiala bụ Mohammadu Buhari akpọọla oku ka ebe niile daa jụụ n'ime ọgbaghara dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị ọchi ehi na Plateau Steeti. Ndị uweoji kwuru na ọgba aghara a nke malitere n'izuụka gara aga ataala isi mmadụ iri asatọ na isi. Mmiri eriela nwa Dbanj Otu nwafọ Naịjirịa ama ama n'iti egwu bụ Dbanj ebeela akwa ụwa ya maka ọnwụ nwa ya nwoke bụ Daniel Oyebanjo bụ onye ọdọ mmiri nọ n'ime ụlọ ha riri ụnyaahụ. Nwata ahụ gbara otu afọ n'ọnwa Mee gara aga. Dịka agba nke mbụ asọmpi Iko Mbaụwa na-akwakọrọ ọnụ, otu bọọlụ dị iche iche na-agba mbọ ị hụ na mba ha gara n'ihu n'asọmpi a. N'ehihie a, Ndị Yuregua ga-ezute Rọshịa n'otu oge ahụ ndị Saụdi Arebịa na Ijiptu ga-achịpụwa. Lee ihe nkiri anyị https://www.bbc.com/igbo/afirika-44599620 +entertainment Ikpe ọnwụ amaala Uduak Akpan maka igbu Iniubong Umoren Ọkaikpe Bassey Nkanang n'ụloikpe elu dị n'Akwa Ibom atụọla Uduak Akpanm ikpe ọnwụ maka ogbugbu Iniubong Umoren. Cheta na Umoren bụ nwata nwaanyị gụchara mahadum na-achọ ọrụ were danya n'aka Uduak Akpan bụ onye gburu ya. ★ N'ụbọchị 29/04/2021 ka Umoh Uduak kwuru sị na enyi ya nwaanyị bụ Happiness Iniobong Umoren gara nwale ajụjụ ọnụ maka ọrụ kama na ọ nọ na nsogbu. ★Ya bụ okwu bidoro na-ewu na soshal Midia nke eji akara #FindHinyHumoren ekesa. Ndị uweojii pụtara kwuo na ọ nwụọla. ★Ndị uweoji kwuru n'ụbọchị 02/05/2022 na ha eburula ozu Ini gawa ụlọọgwụ Mahadum Uyo maka nyocha. Ha kwukwara na ọ bụ n'ili na emighị emi kaha hụtara ozu ya. ★N'otu ụbọchị 02/05/2022 ka ndị uweojii nwuchiri Uduak Akpan. ★Eliri Umoren n'obodo ya bụ Nung Ita, Ikot Essien nke dị n'okpuruọchịchị Oruk Anam, Akwa Ibom Steeti n'ụbọchị 14/05/2021. ★N'otu ụbọchị 14/05/2021 ka ndị uweojii kpopụtara Uduak Akpan onye kwuru na oji ọrụ were rabata Umoren ma gbuo ya mgbe ha nwere nghọtahe. ★Akpụpụrụ Akpan na nna ya bụ Fran ụlọikpe n'ụbọchị 26/07/2021 ebe o kwuru na ọ bụ ya gburu Umoren kama o kwuru na ọwakp;oghị ya n'ike. ★ Kama n'ụbọchị 05/11/2021, Akpan kwuharịrị ihe o kwuru na mbụ were sị na akagidere ya anya mere o jiri kwuo ihe o kwuru na mbụ. ★Dịka a na-ekpe ya ikpe n'ụbọchị 13/04/2022 ka nna Akpan kwuru na nwa ya nwoke nwere ọrịa ụbụrụ nke a na-akpọ schizophernia. nke a bụ ọrịa ụbụrụ na-eme na mmadụ amaghị nke bụ nke. ★Ụlọikpe elu nke dị n'Uyo n'ụbọchị 21/06/2022 kwuru na ọ bụ n'ụbọchị 04/08/2022 ka a ga-ekpe ikpe ikpeazụ maka ọnwụ Umoren. https://www.bbc.com/igbo/articles/cd1e0367dx9o +health 'O nweghi onye gwara m na inye nwa ara na-afụ oke ụfụ' Inye nwa ara bụ otu ihe mara mma nke ukwuu ma bụrụ etu Chukwu siri kee ya na nne ga-esi zụọ nwa ya ọ mụrụ ọhụrụ nrị mgbe ọ ka dị ọhụrụ, Nke a kpatara na ọtụtụ niile ndị na-amụ nwa na-enye nwa ara. Chukwu kere inye nwa ara ka ọ bụrụ ihe mara mma ga-enyere nne na nwa aka ka ha nwee ezigbo njikọ n'etiti ha makwa wulite ịhụnanya n'etiti nne na nwa. Nwaanyị ọbụla mụrụ nwa ọhụrụ maọbụ na-akwado ịmụ nwa na-ele anya na ya ga-enye nwa ya ara. Mana ọ bụkwanụ ihe akị ilu na-atọ na ntị ka ọ na-ada n'ọnụ? Inye nwa ara mara mma nke ukwuu ma bụrụ etu Chukwu siri kee ya mana ọ bụghị ọnatarachi dịka ọtụtụ si eche. Nke a kpatara na ọtụtụ ụmụnwaanyị ji ebe akwa arịrị maka ihe ha na-ezute oge ha na-enye nwa ara. Dịka a na-eme emume ncheta inye nwa ara nke afọ a, BBC Igbo gbara ụfọdụ ụmụnwaanyị ajụjụọnụ gbasara etu inye nwa ara ha siri gaa nakwa ihe e kwesiri ịgwa ụmụnwaanyị tupu ha amalite inye nwa ara. Lee ihe ndị ha sara anyị n'onyonyo dị ebe a. https://www.bbc.com/igbo/articles/c13nmymd6p4o +entertainment Victor Olaiya: Lee ihe ndị a ga eji echeta otiegwu a larala mmụọ "Chaị! Ala eriela ihe o! Otiegwu Victor Olaiya alaala mmụọ. Olaiya nwụrụ n'mgbede ụbọchị Wenezde bụ abalị iri na abụọ nke ọnwa Febrụwarị 2020. Ọ bụ n'ụlọọgwụ mahadum Legọs ka ọ nọrọ nwụọ ka ọ rịachara ọrịa nwa oge. Ọ gbara afọ 89 tupu ọ wụsa ọwara. Akọwa akụkọ ndị mere ka a na-anụ aha Naịjirịa n'ihe gbasara iti egwu, a ga-akpọrịrị aha Victor Olaiya. Ihe e ji mara ya bụ igbu opi Bekee na-akpọ ""trumpet"". Olaiya bụ onye Ijesha-Ishu dị n'Ekiti steeti, mana ọ bụ na Calabar ka a mụrụ ya. Ka ọ gụchara akwụkwọ sekọndịrị na Legọs, nna ya zipuru ya mba Amerịka ka ọ gaa ọzụzụ dịka Njinia, mana Olaiya ruru ebe ahụ mụwa maka iti egwu. Nke a wutere nne na nna ya nke ukwu. O hibere otu egwu ya nke ọ kpọrọ 'cool cats' n'afọ 1954. Oge Ezenwanyị mba Briten bụ Elizabet bịara Naịjirịa na 1956, ọ bụ Olaiya na ndị egwu ya tiri egwu iji nabata ya. Egwu ya gụnyere ""Ọmọ Pụpa"", ""Baby Jọwọ"", ""Sisi Eko"", na ọtụtụ ndị ọzọ. Akụkọ kọrọ na Fela Kuti so na ndị otu egwu Victor Olaiya tupu o mechaa pụọ malite otu egwu nke aka ya. Efere egwu Olaiya tipụtara karịrị 20. Oge ikpeazu o tiri egwu dara ụda bụ na 2013 mgbe ya na Tuface Idibia tigharịrị 'Baby Jọwọ' Victor Olaiya lụrụ ọtụtụ nwaanyị ma nwekwaa ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ bụ ndị na-eru ụjụ ọnwụ ya. Gọọmentị Naịjiria kwanyekwara Olaiya ugwu ma nye ya nzere 'Officer of the Order of the Niger' (OON). Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51485091 +entertainment Timi Dakolo: “Ọ bụrụ na Naịjirịa bụ mmadụ gbara afọ 62 a ga m asị ya nwanne m gaa hazie onwe gị” Otiegwu a ma ama bụ Timi Dakolo na BBC Igbo nwere mkparịta ụka gbasara ọtụtụ ihe na-eme Na���jirịa ugbua dịka Naijiria na-eme emume ncheta nnwereonwe. O tinyere ọnụ n'okwu gbasara ọpụpụ ndị mmadụ na-agbapụ na Naịjirịa ugbua. Dakolo kwuru na ya agaghị asị ndị mmadụ apụla mana onye echefukwala ụlọ. Ọ sị onye obula nwaa ike ya otu ọbụla o nwere ike. O kwukwara na ya agaghị agwa onye obula onye ọ ga-atụrụ na ntuliaka 2023 mana onye obụla were uche ha lụọrọ onye nwere ike imezi obodo. O kwuru na “Ọ bụrụ Naịjirịa bụ mmadụ gbara afọ 62 aga m asị ya nwanne m gaa hazie onwe gị”. Ị sị na Naịjirịa nwere ọtụtụ ebe ha na-etufu ego bụ nke ha kwesiri iwepụ. Ọ mara atụ sị na Naịjirịa dịka nwoke mụrụ ọtụtụ ụmụ na-abịakwute ya kwamgbe kwamgbe na-abịa anara ego. Ụbọchị Nna ha jụrụ inye ya, onye ọbụla ekulie zọwa isi onwe ha. Dakolo kwuru na ya na-esi egwu ọhụrụ ga-apụta n'afọ ọzọ bụ nke ga-ekwu ọtụtụ egwu ga-ekwu maka ihunnanya, okwukwe na ihe ndị ọzọ. Gee ihe ndi ọzọ na ihe onyonyo a: https://www.bbc.com/igbo/articles/c723p72exdyo +religion Etu e si gbuo ụkọchukwu Alakuba n'Ebonyi steeti "Akụkọ pụtara na-ekwu na ndị omekome bu egbe agagbuola Sheikh Ibrahim Iyiorji bụ ụkọchukwu Alakuba n'Ebonyi steeti. Ha kọwara na ọ bụ n'abalị ụbọchị Sunde ka awakporo ụlọ ya dị n'Isu n'okpuruọchịchị Onicha dị na steeti ahụ. Onye kwuputara ozi ọnwụ ya bụ Muhammad Kabir Orjiegbulam n'otu a kpọrọ Islam in Igbo Land dị na Facebook kọwara etu o si me. ""Nwanne anyị anwụọla ugbua n'ụlọọgwụ Federal Teaching dị n'Abakaliki"" ka o depụtara n'otu ahụ. O kwukwara na agbara ya egbe n'ubu nakwa n'afọ dị nso n'obi ya n'abalị ụbọchị Sunde. ""E liela ya (Iyiorji) dịka iwu kwadoro okpukpere anyị si nye"" ka o kwukwara. Mgbo niile a gbara ịnweta ndị uweojii Ebonyi steeti amịtaghị mkpụru dịka ọnụ na-ekwuru ha bụ Chris Anyanwụ azaghị ekwentị ya. Ibrahim Iyiorji bụ onye Ohaozara Isu dị n'okpuruọchịchị Onicha dị n'Ebonyi steeti. Ọ gụchara akwụkwọ ma kuziwe nkuzi na Islamic Centre dị n'Afikpo kemgbe 1982. A mụrụ ya 25 Juun afọ 1965. Ọ lụrụ nwaanyị ma mụta ụmụ ise, nwaanyị anọ nakwa otu nwoke. Nwunye kọwara na ha nọ be ha na mgbede ụbọchị ụka mgbe dimkpa isii bu egbe nọ n'ọgbaatumtum atọ dabatara na be ha. Ha hụrụ nwaanyị ahụ ebe ọ nọ n'iro ma kpọrọ ya baa n'ime na-ajụ ha maka ego, sị ha weta ego ha debere. Ọ bụ ka nke a na-eme ka debere nwoke ahụ n'ala ma gbanye ya egbe n'afọ nakwa n'ubu ya. O bibu n'Enọhịa n'Afikpo ebe ọ na-akụzi nkuzi mana o nwetara ụlọ nkuzi ọzọ n'Ohaozara nke mere ka ya na ezinaụlọ ya laghachite n'obodo ya. Ezinaụlọ nwoke ahụ nwụrụ bụ Iyiorji nakwa otu ndi okpukpere Alakuba dị n'Ebonyi steeti ekpesala okwu ọnwụ na mwakpo a n'aka ndị uweojii. Kabir Orjiegbulam gwakwara BBC Igbo n'ekwentị na ihe na-eme ndị okpukperechi ha adịghị ya mma n'obi. Ọ kọwara na o teela aka ndị mmadụ na-ezigara ha ozi mmaja na peeji ha ebe ha nwere ọgbakọ na Facebook. Ọ sị na ọ bụ ndị ""unknown gunmen"" gara be Iyiorji gbaa ya egbe ugboro anọ maọbụ ise. ""E buru ya gaa ụlọọgwụ dị n'Abakaliki, n'abalị ụbọchị Monde, ọ nwụọ, anyị e lie ya"". ""Ọ bụ ndị unknown gunmen, ha na-ezigara anyị ozi mmaja nakwa ozi ịkpọasị oge niile"" ka o kwuru. O kwukwara na a na-akpaso ndị okpukperechi Alakuba ndị Igbo ajọ agwa. Orjiegbulam sị ""O nwee etu e si kwute maka Peter Obi, e lewe anyị anya, e kwuo maka anyị, e kwuo maka Nnamdi Kanu elewe anyị anya, ọ dịghị mma!""" https://www.bbc.com/igbo/articles/cd12lwne94do +entertainment Igbo wrestling Festival: Mgba ndị Imerienwe A hụ dimkpa, ahụ ogologo imi ya. Asọmpi mgba ọdịnala bụ nnukwu emume ndị obodo Imerienwe ji emekọrịta nwanne na nwanne. Ndị mere ihe nkiri a bụ Ikechukwu Kalu na Vining Ogu https://www.bbc.com/igbo/afirika-50960221 +entertainment Flavour N'abania: Ihe jikọrọ mụ na Chidimma Ekile "Flavour Nabania bụ onye ọgụ egwu amaama. Ezigbo aha ya bụ Chinedu Izuchukwu Okoli, mana ndị mmadụ na-etu ya 'Ijele' na 'Flavour of Africa' dịka aha otito ya. Ọ bụ onye Umunze nke dị n'Orumba Saut, n'Anambra state, mana amụrụ ya n'Enugu, ọ bụkwanụ ebe a ka ọ nọ too. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Tọzde, ọ kọwara ọtụtụ ihe, nke otu n'ime ha bụ ihe gbasara ya na otiegwu ọzọ bụ Chidimma Ekile. Cheta na ọtụtụ asịrị efesaala na mmadụọ abụọ a na-eme ọyị nwoke na ọyị nwaanyị. Mana Flavour kọwara na ya na Chidimma dị na mma, mana adịmnamma ha bụ naanị maka iti egwu. O kwuru sị: ""Ihe jikọrọ mụ na Chidimma bụ egwu."" ""Oge anyị susuru ọnụ n'onyonyo, ọ bụkwa egwu, n'ihi na egwu anyị tiri n'oge ahụ bụ egwu ịhụnanya."" ""Isusu ọnụ ahụ dịka ime ejije iji gosipụta ihe anyị na-agụ na ya bụ egwu."" ""Ọ dị ka oge mmadụ nwụrụ n'ime ejije (film). Onye ahụ anwụghị n'eziokwu maka na ị ga-ahụkwa ya na onyonyo ọzọ."" Lee etu ya bụ mkparịtaụka si gaa: Flavour bụ gbazuoagụ n'ihe gbasara iti egwu. Ọ tiela egwu ụka, egwu ọdịnala, egwu oringo, egwu agbamakwụkwọ, na ọtụtụ ụdị egwu ndị ọzọ. Mana ụfọdụ na-ekwu na e ji egwu dị aṅaa mara ya, egwu ndị dịka; 'pantị nọ n'ilo', 'ala dara ada adago' na ndị ọzọ. Ya na ndị ọtiegwụ ndị ọzọ agụọla egwu, ndị dịka Chidimma, Zoro Swagbag, Phyno, Ụmụ Obiligbo na ndị ọzọ. Na mkparịtaụka Flavour na Jessica Nwankwo, onye ntaakụkọ BBC Igbo nwere, ọ gwara ya ihe ndị dị aghaa dịka: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-55180835 +politics Akụkọ dị mkpa taa: Onye ga-azọta ọkọlọtọ APC n'Imo taa? Akụkọ ndị dị mkpa taa Esemokwu dị n'otu APC n'Imo steeti eyirila trọuza dịka Okorocha na-aba mba. Aka na-achị Imo steeti agwaala onyeisi otu APC bụ Adams Oshionhole ya rituo n'ọkwa maka mbọ ọ na-agba ị kewa APC. Ọ na-abịa dịka taa bụ ụbọchị ịkpeazụ tupu INEC akpọpụta aha onye ga-azọ ọkwa Gọvanọ na Naịjirịa niile. Ọzọ, Otu ọkaiwu bụ Isaiah Ayụgụ arịọla ụlọịkpe dị n'Abuja ha mee ka Femi Fani Kayode nakwa Enyinnaya Abaribe bịa zara ọnụ ha maka ọsọ Nnamdi Kanu gbapụrụ na Naịjirịa. O kwukwara ka anwụchie ndị niile katọrọ ndịagha Naịjirịa ma boo ha ebubo ntọrọ Kanu gụnyere onye ọkwaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor. Na mba ofesi Mba Zimbabwe ga-ebido ị mịpụta mmanụ agbịdị n'ala ha dịka achọpụtara na enwereike ịnwe ya bụ mmanụ n'ala ha. Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwagwa zipụrụ ya bụ ozi ma kwukwa na ọrụ ga-ebido n'afọ abụọ na-abịa. N'egwuregwu, Dịke n'ịgba ọsọ bụ Usain Bolt apụọla n'otu egwuregwu bọọlụ Mariners nke mba Ọstralia. O kelere ndị isi otu bọọlụ ahụ ebe ọ nọ anata nkuzi kmegbe ọnwa ọgọst. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: https://www.bbc.com/igbo/afirika-46054510 +entertainment Igbo culture: Egwuregwu ụmụaka Igbo jiri nwee aṅụrị oge gboo. N'oge gboo, ndị nne na-eji olu ike akpọtụrụ ụmụaka ha kpapụrụ akpapụ gaa igwu egwuregwu n'agbataobi ha maọbụ n'ama egwuregwu. Ọ na-abụ nwantakịrị nụ olu nne ya, o jiri ọsọ jiri ije laruo ụlọ maka ụtarị. •Otanjele, uri na ihe ntecha ndị ọzọ ụmụagbọghọ Igbo ji achọ mma mgbe gboo •Uru egwu ọnwa bara na ọzụzụ na njikọ ndị Igbo •Ekwensu ọ bụ 'satan' n'ala Igbo? Oge ahụ ka ụmụaka mara etu e si enwe aṅụrị na etu e si egwu egwuregwu. Oge ahụ, ndị mmadụ anaghị achịrị obi ha n'aka maka onye agbataobi ha, kama nwa bụ nwa ọha, nwantakịrị ọbụla nwereike ịga n'ụlọ onye agbataobi ya ọbụla soro ụmụaka ibe ya gwurutu egwu. Egwuregwu akarịka nụ, tupe e mee nke a, mee nke ọzọ, chi a na-achọ iji, ụfọdụ oge, ụmụaka anaghị echeta dị na ha eribeghi nri. Ọ dịzị ka ụfọdụ egwuregwu ahụ alachala maka na o nweghizi onye nwere ohere ha ugbua, nakwa egwu abịala ọtụtụ mmadụ, e nweghizi ntụkwasi obi ebe agbataobi nọ. Mana, ọ dị mma ka anyị laghachitu azụ chetara gị ihe ndụ dịka ya oge oge gboo. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52577001 +health Coronavirus: 'Anyị ga-eji 'Mobile App' ahụ na ụmụakwụkwọ mere ihe omume enyere ha' Iwu mmechi gọọmentị nyere ka ụloakwụkwọ mechie biara na mberede nye ndị ụlọakwụkwọ maka ọrịa coronavirus. Mkparịtaụka BBC na onye isi ụloakwụkwọ 'First Nuture' bụ Chidinma Nwoke na nke 'Great Lawra Wood School Queens Hall' bụ Ngozi Ikoro gosiri ihe ha na-eme ka ha ọmụmụ ụmụakwụkwọ ha na-aga n'ihu. Ha kọwara na na-agbanyeghị na mmechi a bịara na mberede, ha ga-eji ihe dịka Whatsapp na mobile App akụzịrị ụmụakwụkwọ ihe dịka ha nọ n’ezumike. Ha rịokwara nne na nna ka ha nyere aka ị hụ na ụmụ ha mere ihe omume e nyere ha n’ụlo akwụkwọ n’oge ezumike a. https://www.bbc.com/igbo/media-52006879 +politics Mamman Daura: Okwu ya maka 'zoning' abụghị uche onyeisiala Buhari- Garba Shehu "Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na okwu Mamman Daura bụ nwa nwanne onyeisiala kwuru maka 'zoning' abụghị uche onyeisiala. Shehu kwuru sị na ihe Daura kwuru na ọchịchị Naịjirịa kwesịrị ịbụzị onye tozuru etozu karịa na mpaghara etu ọ bụbu, bụ uche Daura. Ndị Igbo ọnụ na-eru n'okwu akatọọla nwa nwanne Onyeisi Muhammadu Buhari bụ Mamman Daura maka ikwu na agaghị eme ntuliaka onyeisiala n'afọ 2020 na mpaghara o rutere nke Bekee kpọrọ 'zoning.' Ha kwuru na okwu ya nwere ike ibute ọgbaghara ma kposaa ọchịchị onye kwuo uche ya na Naijiria. Daura nọrọ na mkparịtaụka ya na BBC Hausa nwere kwuo na ọ bụghị mpaghara onye si ga-ekwu onye ga-eweghara ọkwa onye ga-achị Naijiria na ntuliaka 2023 kama ọ bụ onye tozuru etozu. Okwu Mamman Daura nwere ike ikposa ọchịchị onyekwuocheya na Naijiria- Nwodo Mana onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo kwuru na ""ọ bụ ka ndị si otu mpaghara Naijiria nọcharala ogologo oge n'ọkwa onyeisiala, ka o chetara na e kwesiri inwe ogogo"" onye tozuru etozu ịzọ ọkwa. Nwodo sịrị na okwu ahụ Daura kwuru megidere iwu Naijiria dịka ọ dị n' Akụkụ 14(3) nke Iwu 1999 nke kwuru na gọọmenti etiti kwesiri ka a chịkọta ya n'ụdị na mpaghara ọbụla ga-esonye na ya nke Bekee kpọrọ ""Federal Character,"" iji kwado ịdịkọnotu. Nwodo onye gbara ama na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ 'AIT' were n'abali Wenezde sị, ""Ana m akwanyere Mamman Daura ugwu mana okwu ya gosiri na ọ maghị ihe na-aga n'ọchịchị Naijiria, nke ọ na-akwanyere Onyeisiala onye ya na ya bụ otu ọbara ugwu n'ikwu ụdị okwu a nke nwere ike ikposa Naijiria. Ọ bụ ihe mwute."" Nwodo, onye tụrụ arịrị maka oke a na-awọ ndị Igbo na Naijiria siri na ""ịchọ onye kachasị tozue etozuo na mpaghara a kachasị megbuo n'ala Naijiria nke bụ Ọwụwa-Anyanwụ"" bụ ihe e kwesịrị ime na 2023. O kwuru na mpahara Ọwụwa -Anyanwụ nwere ebu , nwee mfụ na ndị tozuru ịchị Naijiria. N'otu aka ahụ, Okechukwu C Obioha bụ onye nchịkọta otu 'Southeast for President 2023' bụ SEFORP2023 n'aha ịchafụ kwuru na okwu Mamman Daura kwuru goziri na "" ọ chọkwaghị ọganihu Naijiria."" "" Onye ahụ na-ekwu ụdị okwu ahụ, ọ nọghị na Naijiria. Ọ ga-abụ ugbua mpaghara ndị ọzọ chịchara, o rue oge o ga-erute ndị Ọwụwa Anyanwụ ọ bụrụ na ọ gaghị abụzi na mpaghara na mpaghara?"" Obioha jụrụ ajụjụ sị, ọ bụrụ na ọ bụghị na mpaghara, na mpaghara, gịnị mere ndị mpaghara Ugwu ji sie ọnwụ na Goodluck Jonathan agaghị abịa nke agba nke abụọ ya? Ọ gara n'ihu kwuo sị, ""Okwu ya gosiri na ọ bụghị onye ihe na-aga n'a Naijiria doro anya."" ""E were m ya na ọ bụ na o si n'ụra tete. Onye ọbụla kwuru ụdị ihe, ikuku Covid-19 ji ya."" Nwa nwanne Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Mamman Daura ekwuola na ịzọ ọchịchị ọkwa onyeisiala na 2023 agaghị agbado ụkwụ na mpaghara onye si nke Bekee kpọrọ 'zoning' kama ọ ga-abụ ihe onye nwenwuru ike ime. Daura kwuru nke a mkparitaụka ya na BBC Hausa nwere na nsonso a dịka ụfọdụ ndị si mpaghara Ọwụwanyanwụ na-ekwu na ọkwa ahụ kwesịrị irute ndị si mpaghara ahụ. N'ọsịsa ajụjụ a jụrụ ya maka ihe o chere maka ikenye ọzụzụ onyeisiala afọ 2023, nye otu mpaghara ohere ka ha zọọ, ọ sị: "" Eee, ọ bụ ihe dịrị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla ịchọ onye kachasị mma. Anyị anwaleela ike ọchịchị na mpaghara na mpaghara, mana ọ mịtaghị mkpụrụ."" ""Ihe dị oke mkpa bụ na ọ bụ onye kachasị tozuo ma nwekwa ihe achorọ karịa ebe onye si. Oge eruola oge anyị mekọrịtara mara na anyị niile bu otu."" Ọtụtụ ụmụ Naijiria na-ahụta Daura dịka otu onye n'ime ndị Buhari ji ọnụmmiri okwu ha eme ihe, nke Bekee kpọrọ 'Cabal' dịka Abba Kyari na Isa Funtua. Mana oge a jụrụ ya ma ọ na-enye Buhari ndụmodụ, Mamman sị ""Ana m aga ekele ya ma nye ya ndụmọdụ ma ọ jụọ m, mana anaghị m etinye ọnụ n'ihe agbasaghị m n'ihi na ọ bụghị etu gọọmentị si eme."" Daura, onye kwuru na ya na Buhari tokọrọ ma bụrụ ezi enyi n'agbanyeghị na Buhari bụ nwanne nna ya sị ""Nna m tọrọ Buhari dịka Buhari bụ ọdụdụ nwa nnanna m."" N'okwu mmekọrịta ya na Abba Kyari nakwa Malam Isa Funtua ndị nwụrụ na nsonso, Daura sịrị na ""Ndị ezigbo enyi abụọ akwaala m. Ihe ukwu mere m site n'ọnwụ ha. Ha abụọ bụ ndị ezigbo mmadụ"". Che aka ghọrọ mkparịataụka BBC na Mamman Daura ahụ n'uju ụbọchị Satọde na-abịa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53585246 +sports Barcelona vs Chelsea: Akọọla Barcelona ka ncha nkọta Ndị Chelsea tiri Barcelona mmọnwụ ka ha na Barcelona zutere n'egwuregwu enyi na enyi ha gbara taa bụ Tuzde, ụbọchị 23 nke ọnwa Julai, 2019. Goolu abụọ Tammy Abraham na Ross Barkley nyere zuru inye ha mmeri, n'agbanyeghi na Ivan Rakitic mechara sata otu. Abraham bụ nwaafọ Naịjirịa e binyeburu ndị Derby County (bụ ebe onye nchịkọta Frank Lampard si gafete Chelsea) bu ụzọ gbakaa neetị na nkeji 34. Barkley tụkwasịrị ọzọ na nkeji 81, iji gosi Barcelona na ha ga-emerinwu ha n'agbanyeghi na onye egwu ha bụ Lionel Messi esoghi gbaa. Ha zutere n'asọmpi akpọrọ Iko Rakuten, nke ndị mba Japan ebe ụlọọrụ Rakuten dị hibere maka ịgba bọọlụ ndị enyi na enyi tupu afọ egwuregwu bọọlụ ebido n'ike na ebube. Chelsea zọrọ Barcelona ojukwu n'agbanyeghi na ndị ọhụrụ Barcelona zụtara dịka Antoine Griezmann, Pulisic na ndị ọzọ so gbaa. Dịka ndị klọb niile na-ahọpụta mba ha ga-anọ agba asọmpi nke ha kwa afọ, Chelsea họpụtara mba Japan iji eme nke afọ a. Lee ihe Chelsea dere n'elu Twitter ha: Lekwa ihe nke Barcelona dere na nke ha: Ihe nkiri a ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49078475 +sports Egbe ntụ Arsenal ji bịa ọgụ anyụọla ka ọkụ na be Man Utd Manchester United agbanyụọla ọkụ mmeri Arsenal dịka ha ji ọkpụ goolu atọ a satara naanị otu merie ha. Man Utd nabatara Arsenal bụ ndị nọ n'elu tebulu Premier League na be ha n'Old Trafford, mana ha emezighi ha ọfụma ka ndị ọbịa dịka ha mere ha echeta ebewe. Antony dos Santos ka batara Man Utd ọhụrụ n'izu a bu ụzọ meere Arsenal ọjị site na goolu mbụ o nyere na nkeji 35 bọọlụ ji malite. Bukayo Saka nke Arsenal sara ha site n'ịgbanye goolu nke ya na nkeji 60. Rashford mezuru ya goolu abụọ na nkeji 66 ma jiri goolu nke atọ o nyere na nkeji 75 chọọ ya mma. Mmeri a mere ya nke anọ Man Utd na-emeri n'afọ bọọlụ ọhụrụ a, n'ime ugboro isii ha gbarala bọọlụ. Nke a ebugotela Man Utd n'ogogo nke ise na tebulu Premier League, ebe ha ji pọịntị 12 ugbua. https://www.bbc.com/igbo/articles/c51xxr88z92o +health Covid 19 n'otu nkeji: Ite okwuma o nwerike igbochi coronavirus Okwuma nwere ọtụtụ ihe ọ na-egbochi nke ejiri mara ya. Mana ụfọdụ mmadụ ekwupụtala na e ji okwuma agwọ coronavirus ma a na-ete ya aka. Kirie ihe onyoonyo a ka ị mara ma ọ bụ eziokwu. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Chimamaka Ihenacho na Chimezie Ucheagbo https://www.bbc.com/igbo/media-52100235 +sports Lee ihe anọ Naịjirịa kwesịrị ịmụta n'aka Morocco n'iko mba ụwa nke afọ a Taa ka asọmpi iko mbaụwa Qatar 2022 ga-abịa n'isi njedebe. N'ezie, onwebeghị asọmpi iko mbaụwa maara Afrịka mma karịa nke afọ a. Morocco mechapụrụ Afrịka ihere n'ihu dịka ha bụụrụ mba Afrịka mbụ ga-eru n'agba nke 'semifinal' kamgbe iko mba ụwa malitere. N'aka nke ọzọ ndị 'Super Eagles' nke Naịjirịa etozughị isonye na ya bụ asọmpi ma ya fọkwa ịgafe n'agba nke mbụ. Mba Afrịka ndị ọzọ sonyere n'iko mba ụwa nke Fifa 2022 gụnyere, Cameroon, Ghana, Senegal na Tunisia. Iji ruo n'agba nke 'semifinal', Morocco - nọ n'ọkwa 22 na ngụkọ Fifa - meriri mba ndị bụ ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ dịka Belgium, Spain na Portugal, ndị nọ n'ọkwa 2, 7 na 9 n'otu n'otu na ngụkọ Fifa. Nke a mere ka ndị mmadụ na-ajụ sị gịnị ka Morocco mere n'otu bọọlụ ha nke kpatara ha ji mee nke ọma otu a na Qatar 2022, gịnị kwanụ ka mba dịka Naịjirịa nwereike ịmụta n'aka Morocco? N'ọnwa Ọgọst afọ a ka ndị nhazi egwuregwu bọọlụ na mba Moroko họọrọ Walid Regragui dịka onye nkuzi otu bọọlụ mba ahụ. Ndị mmadụ chere na Moroko ga-ahọrọ onye si mba Yurop, mana ha họọrọ Regragui n'ihi na ha chọpụtara na ọ ma ọrụ. Tupu Regragui abụrụ onye nkuzi otu bọọlụ Moroko, ọ bụ ya duuru otu bọọlụ Wydad AC nke dị na Casablanca, Moroko, wee bulie iko 'CAF Champions League' n'ọnwa Mee afọ a. Ọ bụkwa ya ritere nturu ugo onye nkuzi bọọlụ bụ ọkaibe n'Afrịka n'afọ 2022. Regragui gbara bọọlụ na Toulouse (Fransị) na Racing Santander (Spen) tupu ọ malite nkuzi bọọlụ. Nke a bụ otu ihe ndị nhazi bọọlụ na Naịjirịa kwesịrị ịmụta: iwepu wuruwuru n'akụkụ ma nye onye kacha mara ọrụ ya bụ ọrụ. Mba Moroko hibere ụlọ mmụta maka egwuregwu bọolụ nke a na-akpọ Mohammed VI Football Academy n'ọnwa Maachị afọ 2010, iji chọpụta ndị mba ahụ nwere onyinye ịgba bọọlụ ma bido n'oge nyewe ha ezi ọzụzụ. Otu n'ime ndị bọọlụ Moroko ugbua bụ Nayef Aguerd, nwetara ọzụzụ n'ụlọ mmụta a. Ọ bụkwa n'ụlọ mmụta a ka e si họpụta ndị nọchitere anya Moroko n'asọmpi iko mbaụwa ụmụnwaanyị ndị erubeghi afọ 17 n'ọnwa Ọktoba 2022, ebe ha meriri ndị India, mana ga agafeghị agba nke mbụ. N'afọ 2020 Moroko meriri asọmpi iko mba Afrịka Futsal, ma sonyekwa n'iko mba ụwa Futsal nke afọ 2021, ebe ha meriri mba Solomon Islands (6-0), merie Venezuela (3-2), tupu Brazil agbapụ ha (1-0) n'agba nke quaterfinal. Naịjirịa enweghị ọbụladị otu ụlọ mmụta egwuregwu bọọlụ nke gọọmentị hibere maka ịzụlite ndị na-eto eto na ya bụ egwuregwu. Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ụlọ ọzụzụ dị otu a na-abụghị nke gọọmentị hibere, mana ndị ma maka egwuregwu na Naịjirịa ekwuola ugboro ugboao na ụlọ mmụta ndị a anaghị enweta nkwado dịka o kwesịrị. Ebubo nrụrụaka n'ime otu na-ahazi egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa karịrị akarị. Ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ nke a so adọghachi aka elekere Naịjirịa azụ na ya bụ egwuregwu. N'afọ 2018, onye ntaakụkọ mba Ghana bụ Anas Aremeyaw setere otu onye nkuzi bọọlụ Naịjirịa aha ya bụ Salisu Yusuf ebe ọ naara aka azụ $750 iji họrọ ụfọdụ ndị n'asọmpi. Nke a mere ka a kwụsịtụ ya ọrụ ruo otu afọ ma daa ya nha $5000. Mana ka afọ olemole gachara, otu 'Nigeria Football Federation' nyekwara Yusuf ọrụ dịka osote onye nkuzi ndị 'Super Eagles'. Ọ bụghị ụbọchị a kụnyere mkpụrụ n'ala ka ọ na-epu ome. Ọtụtụ na-ekwu na enweghị ndidi so n'ihe na-aghasa otu bọọlụ 'Super Eagles' nke Naịjirịa. Iji maa atụ, Stephen Keshi larala mmụọ bụ onye nkuzi ndị 'Super Eagles' oge ha buliri iko mba Afrịka na 2013. Ọ bụkwa ya duuru Naịjirịa n'itozu oke maka iko mba ụwa nke afọ 2014, mana dịka a gbapụrụ Naịjirịa n'agba nke abụọ asọmpi ahụ, ndị NFF chụrụ ya n'ọrụ. Onyeisiala Goodluck Jonathan tinyere ọnụ n'okwu ahụ, nke mere ka a kpọghachi Keshi azụ, mana a chụkwara ya ọzọ na 2015. Ọtụtụ ndị ma anya egwuregwu bọọlụ na-ekwu na agaraghị ịchụ Keshi n'ọrụ, n'ihi na ọ ma ọrụ ya nke ọma. Tammy Danagogo bụbu Mịnịsta egwuregwu na Naịjirịa kwuru na ịchụ Keshi n'ọrụ na 2015 bụ nzọhie ụkwụ. Naịjirịa sobu na mba e ji eme ọnụ n'egwuregwu bọọlụ n'Afrịka, mana ọ dịghịzi etu ahụ ugbua. Ọ dị mkpa ka ndị nhazi bọọlụ Naịjirịa jiri ehihie chọwa ewu ojii ugbua tupu chi ejie. https://www.bbc.com/igbo/articles/cle37vj0gzpo +politics Lee ihe i kwesiri ịma maka ndị na-azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo "Igbo sị na ""Eze pụọ Eze anọchie"" etu a ka ọ dị n'ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo ka ha na-akwado ịhọpụta onyeisi ọhụrụ. Ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ ọkwa oge ya bụ afọ anọ n'ime otu ọnụ ọchịchị. Onye ọbụla meriri ntuliaka a ga-abụ onyeisi Ohanaeze nke ugboro iri ga-edu ha ruo afọ anọ ọzọ. Ndị okenye ise ndị nwere agba n'Imo Steetị nakwa ala Igbo niile ga-achịpụ ya n'ịzọ ọkwa onyeisi Ohanaeze nke afọ a. Lee ha: 1: Chidi Osuagwu Ọ bụ nwafọ Imo Steetị . Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Indiana (1975), mahadum Youngstown State (1978), mahadum Texas (1978 ruo 1979), mahadum Pọtakọt (1993). O nwetere ọzụzụ na ngalaba Biochemistry, Chemistry, Medical Chemistry `. Ọ na-akuzi na mahadum FUTO dị n'Owere, Imo Steettị, ọ kụziela n'ọtụtụ mahadum kamgbe afọ 1978. Ọ bụbu onyeisi Ohanaeze Ndigbo nke Imo Steetị site n'afọ 2007 ruo 2009. 2: Chris Asoluka Chris Asoluka bụ nwafọ Imo Steetị. Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa dị n'Ibadan nakwa Mahadum Lọndọn na ngalaba ndọrọ ọchịchị na ọkaiwu. Ọ rụrụ ọrụ dịka onye omeiwu nta n'afọ 1992 ruo 1993. Ọ rụrụ ọrụ dịka kọmishọna na-ahụ maka ego na mmepe akụnaụba n'Imo Steetị site n'afọ 1994 ruo 1996. Ọ ji ọkwa onyeisi ụlọọrụ ""Onne oil and Gas Free Zone Authority"" kamgbe afọ 2013 rute ugbua. 3: Goddy Uwazuruike Goddy Uwazuruike bụ nwafọ Mbano dị n'Imo Steetị. Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị na 'Immaculate Conception Seminary Ahiaeke Umuahia' afọ 1971 ruo 1975. Gụọ mahadum na mahadum Imo Steetị ma banyezie mahadum Naịjirịa dị n'Enugwu ebe o nwetere ọzụzụ dịka ọkaiwu site na 1985 ruo 1988. Ọ bụ onyeisi ọkaiwu n'ụlọọrụ mkpechite ọnụ bụ Uwazuruike and Associates. Ọ rụọla ọrụ n'ọtụtụ ebe dị iche iche nke gụnyere SKARPUT Nig Ltd, Kaygee Communications, Multitrust Services dgz. Uwazuruike ji ọkwa odeakụkwọ ukwu Aka-Ikenga site n'afọ 2002. 4: Joe Nwaorgu Joe Nwaorgu bụ nwafọ Ngor Okpala dị n'Imo Steetị. Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Naịjirịa na mahadum Cambridge dị na Lọndọn ebe o nwere ọzụzụ 'Estate Management'. Ọ kụziri nkuzi na mahadum Naịjirịa afọ iri site na 1974 ruo 1984. Ọ rụrụ ọrụ bekee n'ụlọọrụ gọọmentị etiti ruo afọ 1988 ọ lara ezumike nka. Ọ bụ onyeisi ụlọọrụ 'Joe Nwaorgu and Associates, Estate Surveyors and Valuers' n'afọ 1994 ruo 1996. Ọ rụrụ ọrụ dịka kọmishọna na-ahụ maka ọrụ, ụlọ na njem ụgbọala nke Imo Steetị, nye aka na nrụchapụ ọdọụgbọelu Imo Steetị n'afọ 1994. Nwaorgu ejiela ọkwa osote odeakwụkwọ ukwu Ohanaeze Ndigbo n'afọ 2000 ruo 2004 ma bụrụ odeakwụkwọ ukwu ha n'afọ 2003 ruo 2017. 5: George Obiozor George Obiozor bụ nwafọ Awo-Omamma dị n'Imo Steetị. Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ Awo-Omamma Comprehensive n'afọ 1959 ruo 1963. Gụọ akwụkwọ dị elu na 'Institute of African Studies Switzerland (1967), mahadum South Tacoma USA (1967), mahadum Columbia (1968). Ọ nwere ọzụzụ na ngalaba dịka ọkaiwu mbaụwa, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmekọrịta mba na ibe ya. Ọ kuziri nkuzi n'ụlọakwụkwọ Awo-Omamma, Mahadum Columbia. Ọ rụkwara ọrụ dịka onye na-anọchịteanya Naịjirịa na mba dịka Amerịka (2004 ruo 2008), Izrel (1999 ruo 2003), Cyprus. Ma rụọkwa dịka onyeisi ụlọọrụ 'Nigerian Institute of International Affairs'. O dere akwụkwọ di iche iche banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmekọrịta mba na ibe ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-55276059 +health Coronavirus and Lassa Fever: Ihe ị ga-eme ma etinye gị na 'quarantine' n'ihi ọrịa ndị a Kamgbe ọrịa coronavirus tịpụtara isi, o dosala ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnọdụ nyocha ebe ha na ndị ọzọ anaghị enwe mmekọ. Ụfọdụ n'ime ndị a bụ ndị buterela ọrịa a ebe ndị ọzọ ka na-enyocha ma ọrịa a onwereike igosipụta n'ahụ ha. Ọ na-adịkarị ndị nọ n'ọnọdụa ka ụwa ọgwụla dịka nwata akwụkwọ Naịjirịa bi na Wuhan Chaịna ebe coronavirus malitere si kọọrọ BBC Igbo. Nwa akwụkwọ a bụ onye hụtara onwe ya n'ọnọdụ a kpọrọ 'House quarrantine' sị na ọ na-emetuta ya n'ụbụrụisi. Otu onye dọkịta bụ Mcginger Ibeneme gwara BBC Igbo ụfọdụ ihe ndị hụrụ onwe ha n'ọnọdụ a ga-eme. Ihe ha ga-eme gụnyere: Dọkịta Ibeneme sị na onye dị etu a kwesịrị i na-emega ahụ kwa ụbọchị o tetere n'ụra ka ahụ ya na-esi ike. Ọ gara n'ihu kwuo na onye ahụ ga-agba mbọ na-ezu ike nkeọma. Onye ahụ ga na-eme ihe dịka ikiri TV, ịgụ akwụkwọ, ị pịị ekwentị ya bụ ihe ndị ga-akpọpụ uche ya n'ọrịa a. Nke kachasị nke bụ na onye ahụ ga-enwe echichie ọma mara na ọnọdụ ọ nọ n'ime ya bụ nwa mgbe nta ka ọ ga-ebi. Onye a gaa na-ege ntị n'akụkọ ka ọ mara etu ihe si a aga, ọ ga na-ekpe ekpere nakwa ime onwe ya obiụtọ. Dọkịta Ibenema gara n'ihu kwuo ka onye dị etu a ghara ịhụta onwe ya dịka onye agbahapụrụ. Kama ka ọ mara na ọ bụ maka ọ dị mma nke ya nakwa nke mba niile butere e ji tinye ya n'ọnọdụ ahụ. 'Obodo Wuhan dị ka ịkpa a na-eli mmadụ' - Nwata akwụkwọ Naịjirịa Gọọmentị Anambra agbapeela Ahịa 'Electronics' Nnewi BBC Igbo agbaala afọ abụo... Ụnụ aṅụla ngwọ na nkwụ na-abịa https://www.bbc.com/igbo/afirika-51572006 +politics Nnamdi Kanu Trial: Anyị agaghị ahapụ MNK ka ọ taa ahụhụ dịka nwa enwe nne - Ohaneze Ndigbo "Otu ohaneze Ndigbo ekwuola na ha agaghị ahapụ Mazi Nnamdi Kanu ka ọ taa ahụhụ dịka nwa na-enweghị nne na nna. Alex Ogbonnia bụ onụ na-ekwuru ndị Ohaneze kwuru nkea na mkparịtaụka ya ndị ntaakụkọ Punch nwere n'ụbọchị Fraịde. Okwu a na-abịa dịka eze ọdịnala a ma ama n'ala Yoruba bụ Oba Enitan Ogunwusi (Ooni of Ife) hibere kọmiti ga-aga kwuchitere nwanne ha nwoke bụ Sunday Igboho, onye nọ na mkpọrọ na mba Bene Rịpọblik. Maazị Igboho bụ onye isi otu na-achọ nnwereonwe ala Yoruba dịka Nnamdi Kanu si achọ nnwereonwe Biafra. Ogbonnia kwuru na ndị okenye alaigbo na-enwe nzukọ kwa mgbe kwa mgbe n'ihi Nnamdi Kanu. O kwuru sị: ""Ọ bụghị ihe niile ka anyị ga na-agwa ndị ntaakụkọ. Anyị na-enwe nzụkọ oge ọbụla n'ihi Mazị Kanu."" ""Ọ bụ na nzụkọ ka anyị nọrọ gwa Enyinnaya Abaribe ka ọ kwụrụ dịka onyeakaebe Kanu oge a chọrọ onye ga-ana ya n'akebe."" ""Ohaneze nyekwara ya ndị ọkaiwu ga-anọchite anya ya n'oge ahụ."" ""Achọghị m ka onye ọbụla katọọ ndị Igbo n'ihi Nnamdi Kanu. Anyị agbachighị nkịtị. ""Kanu abụghị nwa enwe nne enwe nna. Anyịa ahapụghị ya ka ọ kwụrụ naanị ya. ""Anyị na-enwe ọgbakọ ugborougboro iji mara ihe niile anyị nwere ike ime iji nyere ya aka."" Cheta na gọọmentị Naịjirịa na-ebo Kanu ebubo imegide Naịjirịa (treason) nakwa iyi ndụ egwu (terrorism). A malitere ikpe ya ikpe n'afọ 2016, mana ọ gbara ọsọ pụọ na Naịjirịa n'afọ 2017 oge ndị agha Naịjirịa wakporo ụlọ ya. A nwuchiri Kanu ọzọ na mba Kenya ma kpụlata ya Naịjirịa n'ọnwa Jun afọ a. Ọ nọzi n'aka ndị DSS ugbua dịka a ga-akpụpụkwa ya ụlọikpe n'ụbọchị 26 nke ọnwa Julaị." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57952306 +health Coronavirus update: Kedụ mgbe anyị ga-enweta ọgwụ coronavirus? Kedụ mgbe anyị ga-enweta ọgwụ coronavirus? Lee ihe ndị ọkammụta na-ekwu maka nke a: Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chimezie Ucheagbo https://www.bbc.com/igbo/afirika-52653977 +sports AFCON fixtures: Ọnyụpa Guinea na Madagascar gbara bụ uru Naijiria Ala adịghị mma bu uru ndị nze. Otu ahụ ka ọnyụpa Guinea na Madagascar gbara n'asọmpi AFCON ụbọchị Satọdee siri bụrụ uru Naijiria. Ugbua, otu egwu Super Eagles bụzị ndị mbụ na 'Group B' dịka ha ji otu ọkpụ goolu asataghị asata gbaa aka ahia mgbe ha zutere mba Burundi. Guinea na Madagascar nyere onwe ha goolu abụọ abụọ na asọmpi ha nke pụtara na ha abụọ nwere naani otu akara otu akara ebe Naijiria nwere akara atọ. Ka ọ dị ugbua, ndị egwu bọọlu Naijiria ga-agafe n'agba nke abụọ ma ha merie Guinea ụbọchị Wenesdee, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Juun. Nkea bu nke mbu mba Madagascar nakawa Burundi na-esonye na asọmpi iko mba Afrịka bụ AFCON, mana ha egosila ụwa na elelịa nwa ite, onwekwara ike gbọnyụọ ọkụ. Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-48735748 +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Wilshere apụọla na Arsenal Akụkọ ndị dị mkpa Ọgbakọ ụmụ nwaanyị Abia steeti arịọla ndị uweojii na steeti ahụ enyemaka ịkwụsị mpụ na ihe ojọọ dị ịcheiche a na-emeso ụmụnwaanyị kachasị ụlọ na-agba mgbere nwa ọhụrụ. Nkechi Ikpeazụ nwunye gọvanọ na-achị Abia kwuru na ịgba akụwụna, mwakpo n'ike na ịmegbu ụmụnwaanyị ajadu so na ihe ndị ekwesiri ịleba anya ma kwụsị kwa. Ọzọ, Gọọmentị etiti eweputala atụmatụ isii ha kwuru na ọ bụ ị ji kwusi nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo na Naịjrịa. Cheta na kemgbe mbido afọ 2018, okwu a eriela ndụ mmadụ narị ole na ole kachasị na Benue steeti. N'akụkọ ofesi, Mba Amerịka esila n'ọgbakọ oke na ugwu ruru mmadụ na UN a kpọrọ United Nations Human Rights council na bekee pụọ. Nikki Haley bụ onye nọchitere anya Amerịka na UN kwuru na nzụkọ ahụ dị aghụghọ ma na-akpa agwa ihu mma abụọ. N'egwuregwụ, Ka asọmpị iko mba ụwa jisike na-aga, Jack Wilshere bụ aha a ma ama n'otu egwuregwu bọọlụ Arsenal ekwuola na ya ga-ahapụ otu ahụ na ngwụcha ọnwa Juun. O depụtara nke a n'elu Instagram ya na oge eruola ọ ga-eji chọrọ ụzọ ọzọ n'ọrụ aka ya bụ ịgba bọọlụ. Gee nkeji ụtụtụ ebe a https://www.bbc.com/igbo/afirika-44545091 +health Covid-19 in Nigeria: Lee ihe ndị mere ụmụ Naịjirịa ekwenyeghị na ọ dị na mba a "Ruo ugbua ọtụtụ ụmụ Najiria ekwetebeghị na ọrịa covid 19 di ire. Ọtụtụ n'ime ha ekwuputela ihe mere ha ji atụgharị uche ma ọrịa a abụ eziokwu ka ọ bụghị. Mana dibia Bekee bụ Chinelo Eluba azakọrọla ekweghi ekwe ndị a. 1.Nke mbụ bụ na ha anaghị ahụ ime ebe a na-edopu maọbụ agwọ ndị bu ọrịa a anya I chetara ihe nkiri gosiri ebe ndị ahụike na-arụ ọrụ na ""isolation center"" na-agba egwu? Nke a socha mee ka ndị mmadụ chee na akụkọ covid-19 bụ akụkọ ifo. Dọkịta Eluba kwuru na gọọmenti enweghị ikike igosi ndị nọ na ""isolation center"" makana ndị ahụ ga-agbarụ ihu ebe ndị mmadụ nwereike ịsọ ha asọ ma ha gbakee. Maka egwu a na-agba ebe ahụ, o kwuru na e nwere ogo atọ n'ụlọ ndopu nke gụnyere ndị covid-19 na-ejisighị ike, ndị ọrịa a jituru, nakwa ndị e ji akụrụngwa na-enye ikuku azọ ndụ. O kwuru na ọ dịghị njọ ma ndị ọ na-ejisighị ike na-egwu egwu maọbụ jiri ekwentị ha na kọmpụta ha na-arụ ọrụ ebe ahụ. 2. 'Ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a erubeghị ogo nke gọọmenti na-akpọpụta' UC Uzo bụ otu onye na-eso BBC Igbo kwuru na ọ dị mana o hibeghị nne etu e si egosipụta ya. Dọkịta Eluba kwuru na ọ ga-adị mma ka gọọmentị pụta kuziere ndị mmadụ etu ha si enweta ọnụọgụgụ ha na-akpọpụta kwa ụbọchị. 3.Ụfọdụ kwuru na 'enweghị ihe dị iche n'ọrịa a na ịba' Okwu a na-eche kpalitere nkwenye a bụ mgbe onyeisi ụlọọrụ mgbasa ozi a ma ama bụ Raymond Dokpesi, rịachara covid-19 ma pụta kwuo na ọgwụ e ji gwọọ ya na ezinụlọ ya butekwara ọrịa ahụ, enweghị ihe dị iche na ya na ọgwụ ịba. Mana dọkịta Eluba kwuru na ọ na-abụ e bute onye a chọpụtara ọrịa covid-19 n'ahụ, e mee ya ezigbo nnyocha ma gwọọ ọrịa ọbụla a chọpụtakọrọ ya na covid-19 n'ahụ ha. Ọrịa ọzọ a nwereike ịbụ ịba. O kwuru na ọ bụ ọgwụ ndị a ka ndị mmadụ ji emegherị onwe ha anya. 4.Ha kwuru na ha 'ahụbeghị onye o gburu' Dọkịta Eluba kwuru na ya bụ ọrịa na-egbukwa egbu ma ọ bụrụ na ndị o ji agaghị ka e nnyochaa ma gwọọ ha n'ụlọ ndopu. N'okwu ya, ọtụtụ mmadụ na-ekweghị aga ụlọ ndopu na-agwọ onwe ha n'ụlọ ha, nke na-ebute ọnwụ ha, ma sị onye ọbụla kpachapụ anya. 5.Ọ bụ ụzọ gọọmenti si eri ego n'efu Ụkọchukwu Salvation Ministries bụ David Ibiyeomie, kwuru n'ihe nkiri na-efegharị na soshal midia n'ọnwa Mee, na covid-19 anọghị na Naịjirịa kama na ọ bụ ụzọ gọọmentị na ụfọdụ ụlọọrụ si eri ego n'efu. Dọkịta Eluba kwuru na ọ bụ gọọmentị ka ọ dị n'aka, ikuziri ụmụ Naịjirịa ihe niile ha na-eme iji buso ya bụ ọrịa nakwa etu ha si eme ya agha, ka ndị mmadụ ghara ị na-efesa akụkọ ụgha ga-etinye ndị ọzọ na nsogbu." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53137907 +health Covid-19 n'otu nkeji: Chloroquine ọ na-agwọ ọrịa Coronavirus? Dịka akụkọ na-ewu na Chloroquine bụ ọgwụ dị ire maka ọgwụgwọ ọrịa Coronavirus. Mana n'aka nke ọzọ, enwebeghị ngalaba ọnụ na-eru n'okwu pụtara kwuo na ya bụ ọgwụ Chloroquine ga-agwọnwụ ọrịa Coronavirus. Ihe onyonyo a ga-agwa gị nke bụ eziokwu. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Chukwunaeme Obiejesi, Jessica Nwankwo na Chimezie Ucheagbo https://www.bbc.com/igbo/afirika-52040820 +health Covid-19 n'otu nkeji: Artemisia ọ na-agwọ coronavirus? Onyeisiala mba Madagascar bụ Andry Rajoelina gwara ndị obodo ha ka ha na-aṅụ mmiri ọgwụ e ji Artemisia na ahịhịa ndị ọzọ wee mee iji gwọọ ọrịa coronavirus. Mana otu 'World Health Organisation' nakwa ngalaba ahụike mba ahụ ekwuola na onweghi nnyocha gosiri na ya bụ mmiri ọgwụ na-arụ ọrụ. Nnyocha dị icheiche ka na-aga n'ihu n'akụkụ ụwa niile iji chọpụta ma a ga-ahụ ọgwụ nke ga-arụ ọrụ. Ka ọ dị ugbua, onwebeghi ọgwụ nke e wepụtarala. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chukwunaeme Obiejesi https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-52405093 +politics Ndụ Ekweremadu dị n'aka Ndume - Ndị ụlọomeiwu Igbo Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a: Osote onyeisiala na-arụ ọrụ dịka onyeisiala ugbua bụ Yemi Osinbajo ejirila iwe chụtuo onyeisi ndị ọrụ nchekwa DSS bụ Lawal Musa Daura. Cheta na ndị ọrụ nchekwa DSS wuchiri n'ụlọ ndị omeiwu taa ma gbochie ha ịba n'ime ọgba ụlọomeiwu. Ndị ụlọomeiwu ntaa si na mpaghara ọwụwaanyanwụ ekwuola na ha ga-ejide Sinetọ Ali Ndume ma ọ bụrụ ọkọ ọbụla kọọ Ike Ekweremadu n'aka ndị EFCC. Onye ndu ha bụ Chukwuma Onyema kwuru na Ali Ndume na-afụnye ndị EFCC ọkụ maka inyocha Ekweremadu. Donald Trump bụ onyeisiala Amerịka ekwuola na mba Amerịka na mba ọbụla ha na ndị Iran na-azụkọ ahịa agaghị enwe mmekọ. Nke a bụ maka mmachi azụmahịa ọ machiri mba Iran maka ngwaagha nuklia. N'egwuregwu, Onye so nwere otu bọọlụ Arsenal bụ Usmanov ekwetela ịnaara ego dị Paụnds nari ise na iri ise site n'aka ogbo ya bụ Stan Kroenke iji zụkọrọ otu Arsenal kpamkpam Kroenke nwere pasentị iri isii na asaa ebe Usmanov nwere naanị pasentị iri atọ n'ọnụ ego Arsenal. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa: https://www.bbc.com/igbo/afirika-45105595 +health World Aids Day 2019: HIV n'ọnụọgụgụ "Ụbọchi mbụ nke ọnwa Disemba bụ ""World Aids Day"" - bụ oge e ji agbasa ozi maka agha a na-ebuso ọrịa a. HIV ka na-aga n'ihu ịbụ nnukwu ihe na-enye ahụike nsogbu n'ụwa gbaa gburugburu. Ihe ruru mmadụ nde 32 anwụọla site n'ọrịa a kemgbe ọ malitere. Mana, ya bụrụ na ndị na-arịa ọrịa na-enweta ọgwụgwọ dị ire, ọrịa a ga-abụ ihe a na-ejikwatanwu ejikwata. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50614393 +health Coronavirus: Ọgwụgwọ ọrịa coronavirus na Naịjirịa, ọ bụ eziokwu ka ọ bụ aghụghọ? "Otu onye ndị gara nata ọgwụgwọ n'ogige nchekwa nje coronvirus bụ Raymond Dokpesi kụwara akịoyibo Nsugbe mgbe ọ nọchara na ya bụ ogige nchekwa coronavirus izuụka abụọ. Dokpesi sị na onweghị ihe puruiche emere ya dịka onye a sị bu ya bụ nje coronavirus. Ọ sị na ọ bụ ọgwụiba ka e nyere ya mgbe ya nọ ebe ahụ ya jiri gbakee. Nke mere o jiri jụwazịa ihe gbasara ọrịa ịba na ya bụ nje coronavirus. Nke a mere ka ndị mmadụ malite ile ya bụ ọrịa na ọgwụgwọ ya ka aghụghọ. Mgbe BBC kpọtụụrụ ndị otu e kpokobara maka ịchịkọta nchọpụta na nlekọta ndị bụ ya bụ ọrịa nke Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) nọ n'isi ha, onye ndu ha bụ John Oladejo sị na ọnweghị ihe mgbagwoju anya dị n'ọgwụgwọ ya bụ ọrịa maka na usoro ha ji elekọta ndị nwere ya bụ nje kwụ ọtọ. Gbasara Dokpesi, Oladejo zara na, ""onye nọ n'ogige nchekwa anyị nwee ọrịa ọzọ, anyị ga-elebe ya anya. Ọ burụ iba ka onye ahụ nwere, anyị ga-enye ya ọgwụ ịba"". Ọ sị na onwere ọgwụ Bekee kpọrọ ""antiretrovirals"" na adị ha ahụ mma, mana kemgbe a matabeghị ọtụtụ ihe gbasara ya bụ ọrịa, e nwebeghị ọgwụ e ji agwọ ya.. Oladejo kwukwara na Nafdac na-elebe anya ịmata ka ọgwụ Chloroquine a ga-akwọlị ya bụ ọrịa a." https://www.bbc.com/igbo/media-52732570 +entertainment "Vicky Eboh Songs: ""Egwu m na-agụ bụ iji jaa ụmụnwaanyị ike""" O doro ewu na ọkụkọ anya na ndị nne dị ezigbo mkpa n’obodo nakwa mbaụwa, nke a mere nwaada Victoria Eboh ji na-etiri ụmụnwaanyị egwu pụrụiche. Eboh bụ oti egwu a ma ama sị na ọ na-eme nke a iji jalite mmụọ ụmụnwaanyị, ọkachasị ndị Nne maka ọrụ ọma ha na-arụ n'ezinaụlọ. A na-akwanyere ha ugwu pụrụiche maka ọrụ ndị gụnyere ịmụ ụmụ, ịzụ ụmụaka, inyere ndị di ha aka, idozi na idokwa ụlọ nakwa ihe ndị ọzọ nke ha na-arụ n'ime ezinụlọ. Eboh kwuru na mmasị ya ịgụ egwu malitere mgbe ọ dị na nwata ma mgbe ọ bụ aghọghọ. Ụjọ mmasị ya n’egwu mere nna ya jiri chọọ ịkwụsị atụmatụ ya ịgụ egwu dịka o kwuru na nna ya tụrụ egwu na mmasị ahụ nwereike ime ka ọ hapụ ịguru akwụkwọ ya n’isi. Nwaada Eboh kwuru na ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Naịjirịa nke Nsukka ma gakwaa ofesị gụruo ya bụ akwụkwọ n’isi. Eboh kọwaara BBC Igbo ihe mere o jiri nwee mmasị ugbua ịgụrụ ndị nne egwu bụ etu obi dị ya ebe nne ya nọ, dịka o kwuru na ọ zụrụ ha nke ọma ma taa ahụhụ. O kwuru na atụmatụ ịgụrụ ndị nne egwu a nwereike ikpalite mmụọ ndị mmadụ ka ha cheta nne ha ma leta ha anya. Eboh kwukwara na nne di ya na-elete ya anya nke ọma, ya bụ na egwu ya abụghị naanị maka nne ya, mana ọ bụ egwu nye ndị nne ọma naanị nọ n’ụwa. O nyere ndụmọdụ na ọ bụghị naanị ndị mụrụ nwa bụ nne, o kwuru na onye ọbụla a kpọrọ nne mee ihe e ji kpọọ ya nne ma mmeruo ya n’isi. https://www.bbc.com/igbo/61202821 +sports Odion Ighalo anatala akpụkpọụkwụ ọlaedo ya sị Nigeria 'ngwanụ ọ ga-adị' "Odion Ighalo edepụtala n'ebe a ka ụgbọ ịgbara Super Eagles nke Naịjirịa bọọlụ ga-ebusa ya. Ighalo gbaara Naịjirịa bọolụ afọ ise bido na 2015 ruo ọnwa Julaị 2019, kwuru na ọ nwaala ike ya, ma kwuo na ọ chọrọ inyere ndị na-etolite etolite ohere igosi onwe ha. O kwuru na obi dị ya mma ịnọchite enya Naịjirịa n'asọmpị, na ịhụnanya ndị mmadụ gosiri ya ka ọ na-agba bọolụ riri ya ọnụ, na ọnụ ya jukwara n'ekele. N'elu akara soshal midia ya ka ọ nọ kwuputa ihe ndị mmadụ nọ na-atamu na nzuzo; nke bụ na ọ zaala aha nna ya ọfụma. O kelekwara ndị otu ya nakwa onye nchịkọta Naịjirịa bụ Gernot Rohr, maka ohere o nyere ya iso gbaa asọmpi a mere ya nke ngwụcha ya. Cheta na Ighalo dị afọ 26 mgbe Daniel Amokachi họpụtara ya ka ọ malite ịgbara Naịjirịa bọolụ. Ighalo emetela ọtụtụ ihe agaghị eji echefu ya na Naịjirịa, ma ndị ọma ma ndị ""ọjọọ"". Nke ""ọjọọ""" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49055703 +politics Bayelsa State: Ihe mere onyeisi ụlọomeiwu nke Bayelsa jiri gbaa arụkwaghịm "Onyeisi ụlọomeiwu nke Bayelsa steeti bụ Monday Bubou-Obolo agbaala arụkwaghịm. Osote onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ Abhraham Ngobere ewerela ọchịchị ugbua. Nke a na-abịa dịka e duchara Duoye Diri dịka gọvanọ steeti ahụ. Akụkọ na-ekwu na Bubou-Obolo rituru n'ọkwa ya n'ihi na ya na Diri si n'otu mpaghara steeti ahụ pụta. Cheta na ọ bụ ụlọikpe kachasị mere Diri gọvanọ dịka ha kagbuchara mmeri David Lyon nke pati All Progressives Congress. Ndị uweojii akwụsịla ngagharịiwe ahụ ndị mmadụ chọrọ ime maka ebubo ana ebo nwa T. A. Orji na nwa ya bụ Chinedu Orji n'Abia steeti Mana anyị nụkwara na ngagharịiwe a nke a sị bụ ka a chụtuo Chinedu Orji n'ọkwa onyeisi ụlọomeiwu Abia Steeti ga aga n'ihu n'Abuja. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti bụ Godfrey Ogbonna gwara ndị ntaakụkọ na ha enwetebeghi akwụkwọ ndị na-akwado ya bụ ngagharịiwe. Mgbe onye ntaakụkọ gwara ya na ndị isi ndị uweojii enwetalarị akwụkwọ nke ha n'Abuja ma nyekwa ikike ka ya bụ ngagharịiwe gaa n'ihu. Ogbonna zara na ha enwetebeghị ntụziaka ndị isi ha gbasara ya bụ ngagharịiwe nke mere na ha agaghị ekwe ka ya bụ ngagharịiwe gaa n'ihu n'Abia steeti. Gọọmentị Legọs Steeti ekwuola na ọrịa ịba Lassa abatala na Steeti ha. Kọmishọna ahụike na steeti ahụ bụ Akin Abayomi kwuru na onye bu ọrịa a nọzị n'ụsọ ebe ọ gaghị emetu ndị ọzọ ahụ n'ụlọọgwụ LUTH. A hụrụ ahịhịa n'ime udu mmanụ ụgbọelu a kpọrọ fuel tank n'ụgbọelu Boeing 737 Max be nke a rụrụ ọhụrụ. Onye isiụlọọrụ Ụgbọelu Boeing sị na ọ maghị ka mmiri si banye n'opi ụgbọghịrị ma gbarụọ ihu kwuo na ha agaghị anabata ụdị ihe ahụ n'ọrụ ha. N'egwuregwu Deontay Wilder aṅụọla iyi na ọ ga-abụ ọkaibe n'iti ọkpọ dị ka Muhammad Ali ma ya lụọ ọgụ nchekwa nturu ugo ya nke ụgbọrọ iri na otu. Wilder kwuru nke a dịka ọ na-akwado ọkpọ nke ya na Tyson Fury ga-akụ n'ụbọchị Satọde. Nwa onyeisiala Naịjirịa bụ Fatima Buhari mere njem mberede na Federal Polytechnic Nekede, Owerri, ụbọchị Monde. Ya bụ nwaada gara njem nleta na ya bụ ụlọakwụkwọ ekwughị ihe ọbụla ka o ruru ebe ahụ. Mana dịka ọnụ na-ekwuru ya bụ ụlọakwụkwọ bụ Ever Nwosu siri kwuo, ""ihe ụlọakwụkwọ anyị na-amasị ya"". Nwosi sị na Fatima gara leta ọtụtụ iche iche ebe dịka ngalaba na-amụ maka ahụike. Mgbe BBC jụrụ ya ihe nwere ike ibute mmasị nwaagbọghọ a n'ụlọakwụkwọ ha, Nwosu sị na ya enweghị ike ịkọwa mana ụlọakwụkwọ ha nọ n'isi ụlọakwụkwọ ndị nka na ụzụ na Naịjirịa dịka ndị National Board for Technical Education (NBTC) si kwuo. O kwukwara na ọ bụ Federal Polytechnic Nekede bụ Mahadum nka na ụzụ akacha achọ na ụle Jamb dịka ndị ụlọọrụ ahụ siri kwuo. Nwosu sị na ọ ga-abụ ihe ndị a mere anya onye ọbụla ji dị na ya bụ ụlọakwụkwọ. Okwukwara na-onweghị ihe ụlọakwụkwọ ahụ rịọrọ ya mana atụrụ anya na ọ nwere ike ịgwa ndị isi ihe ọ hụrụ n'ụlọakwụkwọ ahụ na njem ya. Na tuzdei ka ndị ekperima a wakporo Kwarangulum na Ntsiha bụ obodo abụọ nọketere Chibok. Ọnụ na-ekwuru otu obodo ọzọ nọketere ebe ahụ bụ Allen Manasseh kwuru na-agbakwuru ọtụtụ ụlọ ọkụ n'obodo ndị ahụ dị na Borno steeti. Ndị isi ọchịchị gọọmenti etiti ekwuola na ịchutu ndị isi ọrụnchekwa na mberede ga-emebi ihe na Naịjirịa. Ọ bụ odeakwukwo ukwu gọọmenti etiti bụ Boss Mustapha kwuru nke a n'emume ndị otu Christain Association of Naịjirịa mere. Ọzịọma pụtara na Japan n'ụtụtụ Wenezde a na-egosi na onye mbụ agbala ụkwụ n'ala site n'ọgbọmmiri Diamond Princess eji eji izuuka abụọ maka nnyọcha Coronavirus. Nnyocha gosiri na mmadụ narị ise, iri anọ na abụọ butere ya bụ ọrịa n'ụgbọmmiri ahụ a na-ekpori ndụ n'ime ha. N'egwuruegwu agbara ụnyahụ Atlatico Madrid gbara Liverpool otu ọkpụ. N'aka ọzọ, Borisia Dortmund ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Paris St. Germane." https://www.bbc.com/igbo/media-51556951 +health Menstrual cycle: Ụzọ ise ị ga-esi nyere nwaanyị nọ na nsọ ya aka "Nsọ nwaanyị nke Bekee kpọrọ 'menstruation' na-abịakarị kwa ọnwa, mana ọ bụghị nwaanyị niile ka ọ na-agara sịrịrị werere. Nye ụfọdụ ụmụnwaanyị, mkpụrụ ụbọchị atọ ruo ise ahụ ha na-ahụ nsọ ha na-adị ka ọkụmmụọ n'ihi ihe ha na-eji anya ha ahụ. Ụfọdụ na-anọ na mgbakasị ahụ nke bụ na ị gwa ya ofu okwu ọ bakasịara gị ahị (ihe ọ naghị emekarị), ebe ụfọdụ anaghị enweta onwe ha n'ihi ụdịrị ahụ ụfụ ha na-anọ n'ime ya. Mana dịka ikwu na ibe, enyi, onye ọrụ nakwa onye ya na nwaanyị na-ahụ nsọ ya nwere mmekọ n'ụzọ dị iche iche, kedụ ihe ndị ị ga-emere ya iji nyere ọnọdụ ya aka? 1) Hapụ ya aka: Ọ sị gị hapụ ya aka, nwanne biko sere aka gị ozugbo tupu ọ pụta okwu. Ị na-ajụ ""maka gịnị?"" Ọ bụ makana o nwereike ịbụ na ọ nọ na mgbu na mgbakasị ahụ nke na-esokarị nsọ ụfọdụ ụmụnwaanyị, mana ọ chọghị ịgwa gị. Ihe na-ebutakarị mgbu ahụ gụnyere PCOS, Adenomyosis, na ọrịa ndị ọzọ na-emetụta nsọ nwaanyị. Ọzọ bụ na o nwereike ịnọ na mgbagwojuanya maka ihe ahụ ya na-agabiga, n'ihi na ọ bụghị mgbe niile ka nwaanyị ma ihe ahụ ya na-agabiga ọkachasị ma ọ nọrọ na nsọ ya. Mmiri ọgwụ ahụ ya (Hormone) na-ezigara ya ozi dị iche iche n'oge ahụ, nke bụ na o nwereike inwe isi ọwụwa, ike ọgwụgwụ, agụụ agaghị na-agụ ya, ike okwu adịghị ya maọbụ ọ na-atakarị mmadụ. 2) Maa ya mmiri ọkụ Ị ma na mmiri ọkụ na-enyere ụfọdụ ndị nsọ ha na-enye nsogbu aka ikutetu ume ma ọ na-egbu ha mgbu? Nwaanyị nsọ ya na-egbu mgbu na-achọ ihe ga-ebelatatụ ụfụ na-afụ ya, ebe ahụ ka mmiri ọkụ ga-abata dịka onye nzọpụta. Ndị ọcha wepụtara nke a na-akpọ ""hot water bottle"", nke bụ mmiri ọkụ gbọrọ agbọ a gbara na mkpọ rọba, nke onye ahụ ga-atụkwasị n'ebe ahụ na-egbu ya mgbu. Ntụkwasị a nakwa ụzọ ọzọ bụ iji akwa maa onye ahụ mmiri ọkụ n'afọ, ukwu ma n'azụ, na-eme ka ọbara gbakọrọ ebe ahụ gbazee ma nyetu onye ahụ ohere ikurutu ume. A na-ejikwa mgbatị ahụ ebelata mgbu n'oge nsọ nwaanyị, mana mmiri ọkụ ga-enyere onye ike adịghị ịgbatị ya bụ ahụ, ya na ụfọdụ ọgwụ nke dọkịta na-enye n'ụlọogwụ. 3) Zụtara ya 'sanitary pad' Ị nụkwara ego ole a na-erezi 'sanitary pad' ugbua? Pad dịzị ọnụ ugbua, mere ka ego e jiri zụta ya dị ka 'a kpata a tụfuo'. Ya mere, otu ihe ọma ị ga-emenwuru nwaanyị nọ na nsọ ya bụ inyere ya aka zụta ụfọdụ, ọ na-eji 'pad' o, nke a na-akpọ tampon, maọbụ iko, gbaa mbọ hụ na ị zụnyere ya. Ọ ga-ekele gị maka ihe ọma a. 4) Nye ya nri: A na-ekwu na ụmụnwaanyị hụbigara nri n'anya oke, mana ị ma na nye ụfọdụ ụmụnwaanyị, ọ bụ mgbe ha nọ na nsọ ha ka ha na-aka achọ nri. Nye ya nri ọbụla ọ chọrọ, mana mee ka ọ mara na ọ bụ nri na-edozi ahụ ga-akara ya mma iri n'oge ahụ. Nri ndị dị ka mkpụrụosisi, osikapa nchara (brown rice), ube, akwụkwọ nri ndị nwere faịba na-aka mma iri n'oge nsọ nwaanyị. Na-adụ ya ọdụ ka o nwee ike ịṅụ mmiri n'ihi na ọ na-enyere aka ibelata mgbu ọ na-agabiga. Gbaa mbọ hụ na mmiri akọghị ya ebe ọbụla ọ nọ. 5) Gee ya ntị, gbaa ya ume: Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-eme ka ndị a 'gbara ọgwụ anwụ n'isi' ma ha nọrọ na nsọ ha, n'ihi ihe anyị kwuru maka ya n'elu (hormone). Mana ị gee ya ntị ma tinye uche ịhụ na ọ nọghị na mgbu, dibe ihe ọbụla o mere gị n'ihi na ọ machaghị ụma eme. Ihe ọzọ ị ga-emere ya bụ ịnọ nso nke ga-abụ na ọ chọọ enyemaka gị, ị gaghị anọ ebe tere aka. E nwekwara ụzọ dị iche iche i nwereike iji nyere ya aka, mana gaa mee ka, ka ọ ka fọdụ n'ihu." https://www.bbc.com/igbo/afirika-54441243 +sports Barcelona vs Real Madrid: Ha kere onwe ha agbụ "'O ji onye n'ala ji onwe ya' bụ ihe Barcelona Real Madrid mere onwe ha n'asọmpi El Clasico. Barcelona nabatara Madrid n'ụlọ ha bụ Camp Nou buru n'obi ịkwọ ha ara mana Madrid gosiri ihe ha ji bụrụ dimkpa. Onweghi onye ike dị inye ibe ya goolu agbanyeghi mbọ otu abụọ ndị a gbara. Dịka ọ dị ugbua ha abụọ nọ n'otu akara iri atọ na isii na tebụlụ mana Barcelona ji ọnụọgụgụ goolu kara Real Madrid. Ọrụ akwụna emegideghi iwu Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ekpebiela ikpe otu nwaagboghọ bụ Constance Nkwocha na mmadụ iri na ise ndị ọzọ gbara ụlọọrụ Ministrị Abuja na ndị otu ha maka ịwakpo ha. Ikpe a nke ọkaikpe Binta Nyako kpebiri kwuru na ịgba akwụna emegideghị iwu na Naịjriịa dị ka akwụkwọ iwu kwuru na agba nke iri atọ na asaa 'Section (37)'. Nke a pụtara na ndị uweojii enweghi ike ịwakpo ha n'ụdị ọbụla. Ụlọikpe ahụ dara Ministri Abuja na ndị otu ha nha otu nde naịra na ụma ise (N1.6M) maka ịwakpo ụmụnwaanyị ahụ. Dịka ụlọomeiwu ukwu na-akpọ oku maka itinye anya n'okwu gbasara ndị mba Ghana Ịkpọchị ụlọahịa ụmụ Nịajirịa na mba ahụ ha jikwa anya nke ọzọ ebe akwa maka onye otu ha nwụrụ. Akụkọ na-ekwu na onye na-anọchite anya Okigwe North Senitorial District n'Imo steeti bụ Ben Uwajimogu lara mmụọ n'abalị bọtara Wenezde. Ọzọ, ụzụ ọṅụ na-akpọtụọla n'obi gọọmentị dị iche iche taa ka ụlọikpe kpebiri ikpe ntuliaka ndị ọchịchị. Ndị na-enwe ya bụ ọnụ bụ... El-Rufai nke Kaduna Abdullahi Sule nke Nasarawa Udom Emmanuel nke Akwa Ibom Sanwo Olu nke Legọs Na Aminu Masari nke Katsina Steeti Nwanna taa ka a ga-ama ma onyeisiala Donald Trump aga-anọ ka ọ ga-apụ. Ntuliaka na-aga n'ihu ugbua n'ụlọomeiwu nta n'Amerịka maka nke a. Nke a mere ịchụpụ ya bụ onyeisiala mba Amerịka ji enwu enwu na Naịjirịa too bụ Wenezede nke bụ na ihe karịri mmadụ puku anọ nọ na ya bụ akụkọ na Twitter. Ọnye ọzụzụ atụrụ, Reinhard Bonnke bụ nwaamala mba Jamani wetere ihe dị iche n'usoro e sị efe Chineke na mbaụwa nke mere o jiri nwee ọtụtụ ndị nso bụ ndị nke na-eru uju ya ugbua ka ọ nwụrụ n'afọ 79. Bonnke puruiche ma ya na ndị ọzọ busara ozi Krist n'Afrịka maa aka, site na Bill Graham nke Amerika ruo na Charles Spurgeon nke Briten. Ọ bụ nwaamadị a mere ka enwee nnukwu ọgbakọ ndị ụka nke nwere ike ị nọrụ otu izuụka n'ọgbọ nke sara mbara buru sọ mma. Mgbe ụfọdu ọ kpọtakwa ndị asụsụ dị iche iche maka ịtapịa okwu ya. Ọ mechere nwe ndị oziọma na-ejije ya ka o sị ezisa ozi chukwu. Tupu o mechie oziọma ya, ọ na-ajụ sị "" kedu onye ometutere n'obi ịbịa were igweokwu a bịa zie ozi chineke?"" Oziọma ya maka ịgba ndị nọ n'ahụhụ ume n'Afrịka puruiche, ọkacha mba nọ na ahụhụ na ụka. Ụfọdụ na-ekwu na mmadụ dịka TB Joshụa na ndị ozi Chineke ndị ọzọ n'Afrịka so nzọụkwụ Bonnke. N'egwuregwu, Barcelona na Real Madrid ga-akwata n'elekere asatọ nke abalị a. Onyenkuzi Real Madrid kwenyere na ya bụ asọmpi ga-aga n'ihu agbanyeghị ngagharị iwe na-eme na Barcelona. Nyocha usoro atụmatụ 'Visa free' - Abaribe Enyinnaya Abaribe akpọọla oku ka enyocha ọfụma usoro ga-enye ndị mba Afdrịka niile ịbata Naịjirịa ka o si sọ ha bụ 'Visa on Arrival' na Bekee nke onyeisiala Naịjirịa kwuru na a ga-amalite n'oge adịghị anya. Abaribe bụ onye omeiwu na-anọchite anya Abia South n'ụlọomeiwu kọwara na ọ dị mma ịleta ụmụ Naịjirịa tupu eletaba ndị mbịara mbịara. Ọ na-akpọtụrụ ụmụ Naịjirịa na soshal midia dịka ha na-akatọ ijeri naira iri atọ na asaa bụ nke ụlọomeiwu ukwu mapụtara iji ruzi ụlọọrụ ha. Ụmụ naịjirịa na-ekwu na ego ahụ kwesiri ịbanye ebe ndị dị mkpa dịka agụmakwụkwọ, nwulite ahụike nakwa ịrụzi okporo ụzọ. Mana ihe ha amaghị bụ na ego ahụ esighị na bọọjetị Naịjirịa kama n'ime bọọjetị Abuja. Ọchịagha ndị agha mba Fransị na-alụso ndị oyindụ egwu ọgụ n'Afrịka adọọla aka na ntị na ọ bụrụ na amaghị ihe e mere, otu ISWAP nwereike ịnọchị mba ndị dị na mpaghara Sahel Afrịka. Francois Lecointre kwuru na ekwesịghị inye gbagharịa dapụtara na ọgụ ahụ ohere n'ihi na ISAWP ga-ewere ọnọdụ na ya. Ụlọoriri MacDonalds agbachiela ụlọọrụ ha niile n'abalị abụọ iji kwanyere ndị ntorobịa nwụrụ n'ụlọọrụ ha dị na mba Peru ugwu ikpeazụ. Alexandra Inga na Gabriel Zapata nwụrụ mgbe ọkụ latrik dọgburu ha n'usekwu McDonalds ka ha na-arụ ọrụ n'abalị. Akụkọ kwuru na ọku ahụ bu ụzọ jide Alexandra nke mechara jide Gabriel mgbe ọ gara ịnye ya aka. Ngalaba na-ahụ maka nchekwa n'ụlọọrụ na Peru amalitela nyocha banyere ya bụ okwu. Ụlọomeiwu nta agbajọọla mgbanwe iwu ala ga-enye onyeisiala nakwa ndị Gọvanọ sọsọ otu ikikere afọ isii ịnọ n'ọkwa. John Dyegh nke Benue steeti chepụtara mgbanwe a kwuru na ọ ga-enye aka ịbelata oke tigbuo zogbuo na-arị ibe ya elu n'oge ntuliaka. Onyeisiala Naịjirịa ekwuola na Naịjirịa nakwa ụlọọrụ nrụpụta ụgbọala bụ Hyundai ga-etikọta isi ọnụ ịhibe ụlọ nrụpụta ụgbọala ha na Naịjirịa. Nke a pụtara n'akara Twitter onye eyemaka ya na mgbasaozi bụ Garba Shehu n'abalị Tusde. Cheta na ndị mmadụ malitere ịjụ ajụjụ maka ọnọdụ Naịjirịa n'ọnwa Ọgọst mgbe Toyota kwuru na ha ga-ehibe ụlọọrụ ha na mba Gana Ekwe kụrụ n'isi otu Liverpool mgbe Aston Villa ji ọkpụ goolu ise asataghị otu dọka neetị ha n'asọmpị Carabao Cup. Cheta na ọ bụ otu abụọ nke dị obere Liverpool zutere Aston Villa Tusde." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50833176 +politics Ecowas Summit: Issoufou Mahamadou bụzị onyeisi ọgbakọ a Onyeisiala mba Niger Republik bụ Issoufou Mahamadou abụrụla onyeisi ọgbakọ jikọrọ mba nile dị n'ọdida anyanwụ Afrịka a kpọrọ Ecowas. Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari hafere Mahamadou ọchịchị n'ọgbakọ Ecowas nke iri ise na ise nke e mere na Abuja ụbọchị Satọdee. A nọkwara n'ọgbakọ ahụ cheta ma tube dibia Bekee Ameyo Adadevoh nakwa Kofi Annan ugo. Adadevoh bụ dọkịta nyere aka gbochie mgbasa ọrịa Ebola na Naijiria, ebe Annan bụ aka chiburu ọgbakọ mba uwa a kpọrọ United Nations. Cheta na Buhari nọkwa n'ọgbakọ ahụ kwuo na ndị isiala mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka ga-emepụtarịrị otu atụmatụ iji buso nsogbu nchekwa agha na mpaghara ahụ. O kwuru nke a na nzụkọ iri ise n'ise nke ọgbakọ Ecowas na Abuja n'ụbọchị satọde. Ndị otu Ecowas kpebikwara na mba ọdịda anyanwụ Afrịka ga na-ejizi otu ụdị ego a kpọrọ 'Eco' were azụkọrịta ahịa. Aka ndị uweojii akpara otu nwata nwaanyị dị afọ iri abụọ nke akụkọ kwuru sugburu dị ya na Nsugbe. Ndị uweojii kwuru na nke a mere dịka nwaanyị ahụ na di ya na-ese okwu ma na-alụkwa ọgụ. E nyere aha nwaanyị ahụ dịka Makudochukwu ebe aha nwoke ahụ bụ John Bosko Ngu. Akụkọ kwukwara na agbalịrị buga nwoke ahụ ụlọọgwụ mana azọtaghị ndụ ya. Mba Kamerun na Gana gbara onwe ha onye laba onye laba mgbe ha zutere onwe ha taa. Onwekweghi onye nyere goolu ọbụla nke fọrọ ibe ya ịsata ya bụ goolu. Cheta na Super Eagles Naịjirịa ga-ezute Madagaska n'ụbọchị ụka. Gọọmentị Naịjirịa adọọla ndị na-eme njem na mba Itiopia aka na ntị sị ha ejila ego gafere puku dọlla atọ bata n'obodo ahụ. Ha kwuru na mba Itiopia ga-ejichi ego ọbụla karịrị nke a n'Iwu ọhụrụ mba abụọ a weputara iji buso agha megide nrụrụaka ego. Osote onye ndu otu Super Eagles bụ Ahmed Musa ekwuola na ngalaba NFF ka ji ha ụgwọ asọmpị ha gbara agba. O kwuru nke a n'ọgbakọ super Eagles na ndị ntaakụkọ nwere n'obodo Alezandrịa n'Ijipt. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48814081 +business Lee Alex Nwa-Ephraim Akwaiwu nwa afọ Igbo na-arụ ụgbọala Alex Nwa-Ephraim Nwaiwu bụ nwa afọ Igbo na-arụ ụgbọala nke o kwuru maka ụzọ ọjọọ dị n'ala Naijiria. Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho, Chiemela Peter Mgbeahuru Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-47858756 +business Ụtụisi gọọmentị na-achọ ịtọgbu anyị - ụfọdụ ndị bi n'Anambra na-ekwu "Okwu e ji mara ọchịchị Chukwuma Soludo n'Anambra Steeti bụ ""kwee ka ụtụisi gị rụọrọ gị ọrụ"" mana ụfọdụ ndị bi na steeti ahụ na-ekwu na oke ụtụisi na-achọzi ịtọgbu ha. N'izu ụka gara aga, ngalaba mkpofu ahịhịa nke Anambra steeti bụ 'Anambra State Waste Management Board (ASWAMA) wepụtara ụgwọ ọhụrụ nke ndị bi na steeti ahụ ga na-akwụ iji kpofu ahịhịa ha. Ụgwọ ọhụrụ a nke a buliri elu malitere ịdị ire n'ụbọchị mbụ nke Ọkụtoba 2022. Ndị gwara BBC Igbo okwu kwuru na ego na-abata ha n'aka na-epewanye mpe, gọọmentị abịakwa na-ebuli ụtụisi. Chukwudi Ugwu, onye na-azụ ahịa n'Eke Ọka kwuru sị: ""Ụtụisi niile a akarịala, ọ ga-eme ka ọnụego ihe n'ahịa na-agbali elu ebe ego e ji azụta ihe ndị a na-agbatu."" ""Anyị ma na gọọmentị anaghị enwetazi nnukwu ego ha ji arụ ọrụ, mana okwesịghị ka ọ bụrụ ndị mmadụ nkịtị ka ha ga-ebufere ya."" N'aka nke ya, Oriaku Tonia Chukwuanu kwukwara ihe yiri nke a; ""mbuli ụtụisi a na-abịa n'oge ọjọọ,"" Tonia kwuru. ""Ọtụtụ ndị ahịa na-agabiga nnukwu nhịahụ ugbua n'ihi etu ọnọdụ akụnụba obodo anyị dị. Ọ ga-adị mma ma gọọmentị tulee ihe ndị a tupu ha ebuliwe ụtụisi."" Vivian Okafor, onye na-ere nri, kwuru nke ya hoohaa, ""mbuli ụtụisi a na-atọgbụ ahịa anyị"". Iji maa atụ, Vivian kwuru na ụtụisi gọọmentị nyere ha bụ ndị na-ere nri bụ N48,000 kwa afọ. ""Ndị obere ụlọ ahịa (smale and medium scale business) agaghị ekuteli ume n'ụtụisi niile ndị a,"" ka o kwuru. 'Sanitation' rate' nke ndị ASWAMA tinyere malitere ịdị ire n'ụbọchị Ọkụtoba 1. N'ime nke a enwere ngalaba atọ: Ime obodo, obodo ndị mepetụrụ emepe, na obodo ndị mepere emepe nke ọma. Ngalaba atọ a nwechara ụgwọ dị icheiche ha kwesịrị ịkwụ, lee nkọwa ya na foto dị n'elu. Ụtụisi ndị ọrụ okporoụzọ Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ ụgbọala, ndị keke na ndị na-anya ọgbatumtum ga mere ngagharịiwe maka ego ụtụisi ọhụrụ nke gọọmentị Anambra steeti wepụtara ka ha na-akwụ kwa ọnwa maọbụ kwa afọ. Lee etu ụtụisi nke a si dị: Gọọmentị Anambra kwuru na tupu oge a, ndị ọrụ ụgbọala na-akwụ ụgwọ karịrị nke a n'aka ndị agboro, mana ya bụ ego anaghị abata n'akpa gọọmentị. Ya mere o ji tinyezie usoro ụtụisi nke a ma machie onye nkịtị ọbụla ịnakọ ndị ọrụ okporoụzọ ụtụisi. Ụtụisi ndị na-ere mmanụ 'petrol' N'ọnwa June kwa, otu jikọrọ ndị na-ere mmanụ ụgbọala, bụ 'Independent Petroleum Marketers Association' kwuru na ha ga-agba abụbụ ọrụ n'ihi na gọọmentị buliri ego ha na-akwụ karịa 40%, site na N100,000 ruo N150,000. Mana ha mechara kagbuo abụbụọrụ ahụ dịka gọọmentị wepụturu obere ego n'ego ahụ ha na-akwụ ka ọ bụrụzie N120,000." https://www.bbc.com/igbo/articles/c06x4vlrm38o +entertainment Eri Festival: Ihe mere Oriri Eri ji ewu ewu Oriri Eri 2019 kpọtụrụ akpọtụ zụọ azụọ. Oriri Eri 2019 kpọtụrụ akpọtụ zụọ azụọ. Dịka ọ dị na mbụ, nke afọ a kporo ọkụ nke bụ na ọtụtụ si mba ofesi bịa ya bụ mmemme. Nke a bụ akụkọ Uche Nwa Michael si mba Pakistan lọta maka ya bụ emume. Uche kwuru ihe mere o ji si mba Pakistan lọta. Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Chukwudi Okereke, Chiemela Peters Mgbeahuru Dịka ọ dị na mbụ, nke afọ a kporo ọkụ nke bụ na ọtụtụ si mba ofesi bịa ya bụ mmemme. Nke a bụ akụkọ Uche Nwa Michael sị mba Pakistan lọta maka ya bụ emume. Uche kwuru ihe mere o ji si mba Pakistan lọta. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50626321 +health Urine Cup: Iko ga-eme ka nwaanyị nyụọ mamịrị ka nwoke "Otu nwaanyị Kenya na-eweta usoro e nwereike iji gbochie nsogbu ibute ọrịa site n'ụlọmposi ọha nke na-adịghị ọcha. Njeri Muthaka na-ere iko mamịrị nke na-enyere ụmụnwaanyị aka ịkwụ ọtọ nyụọ mamịrị ka ha ghara ịnọ ọdụ n'ụlọmposi bute ọrịa. Muthaka gwara BBC na o bubatara iko mamịrị a mgbe ọ rịachara ọrịa si na mamịrị ọtụtụ oge. O ji ya nyụọ mamịrị ma chọpụta na o nyere aka belata etu o si ebute ọrịa a, nke mere o ji malite ire iko a. Ndị dọkịnta kwetere sị na iko mamịrị a na-enye aka ibelata ibute ọrịa. ""Ọ bụrụ na ị naghị etukwu ala anyụ mamịrị, ị gaghị eru ụlọmposi nso nke pụtara na ị gaghị eji ike ebute ọrịa. Ị ga-egbochi ibute ọtụtụ nje dị iche iche,"" dịka dọkịnta Chris si kwuo. Mana ụmụnwoke ndị Kenya sị na iko a megidere omenala ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51364672 +politics Attacks on Inec Offices: 'Ọ bụghị ihe ọma nye ndị Igbo na-ana agba ụlọọrụ Inec ọkụ' "Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Ọwụwa Anyanwụ ekwuola na ọ bụghị uru nye ndị Ọwụwa Anyanwụ na a na-agba ụlọọrụ ngalaba na-ahazị ntuliaka Naijiria bụ Inec n'ịchafụ ọkụ aghar aghara na mpaghara ahụ. Ha kwuru na ọ bụghị naanị na ọ ga-emegide ọchịchị onyekwuoucheya, na ọ ga-anapụ mpaghara ahụ ohere iso kwuo onye ga-abanye n'ọkwa Onyeisiala n'afọ 2023 ọbụladị dịka nwa afọ mpaghara hụ so na ndị nwere ohere irite ọkwa ahụ. Nkwupụta na-abịa dịka ndị omekome sunyechara ọkụ n'ụlọọrụ Inec dị n'okpuru Ọchịchị Oru-West dị n'Imo steeti mebie oche na akọrọngwa ọrụ Inec ndị ọzọ Oru-West, ỤbọchịỤka, abalị anọ nke ọnwa Disemba afọ 2022(4/12/2022.) N'ozi ha wepụtara, Inec kwuru na ya bụ mwakpoo a wakporo ụlọrụ ha n'Oru west ga-eme ya nke asaa a na-awakpo ụlọrụ ha dị na steeti ise dị na Naijiria n'ime ọnwa anọ. Ụfọdụ ndị ọrụ na-eru n'okwu na-arụtụ aka na ọ bụ ndị si wụị̀a Anyanwụ na-etinye aja na garị n'ohere ndị Igbo nwere iji vootu ha kwado nhọpụta onye si mpaghara ha dịka onyeisiala. Ha kwuru na o nweghị ka isunye ụlọọrụ Inec ọkụ ga-esi eme ka a ghara ime ntulikaa 2023 dịka ha kwuru ụfọdụ ndị na-eme mkpamkpa ahụ na-eche. Kama, dịka ha siri kwuo, ọ ga-anapụ ndị Ọwụwa Anyanwu ọnụọgụgụ vootu gbalitere elu iso kwuo onye n'ime mmadụ anọ kachasị welite isi na-azọ ọkwa Onyeisiala na 2023 onye ga-abanye n'ọkwa ahụ. Nonso Orakwe bụ onye ndu otu ""Catch Them Young Initiative, kwuru na ụfọdụ ndị na-eme tigbuo ahụ na-eche na ha nwere ike isi n'ụzọ ahụ gbochinwuo ntuliaka 2023. ""Ọ bụghị ihe dị mma nye ndị Igbo na ụdị ihe a na-eme,ọ bụghị ihe ziri ezi."" ""Ọ bụ ihe mgbagwoju anya na n' oge a, na anyị amaghị ihe anyị na-eme."" "" Ụfọdụ na-eche na ha mee nke a, na a gaghị enwe ntuliaka ọbụla."" ""Ọ bụghị ihe ọma nyere ndị Igbo."" ""Mana ọ kwuru na ụfọdụ aghọtaghị ihe onyekwuuche ya pụtara."" Ọ bụ imebicha PVC ,gba ya ọkụ, ọ bụ etu ahụ ka ihe ga-eji ka mma? Ọ ka mma na onye ọbụla gara were PVC ga kwuo onye ọ chọrọ ka ọ chịa."" Orakwe kwuru na o cheghị na ọ bụ ndị si ebe ọzọ batara n'ala Igbo na-emebi ụlọrụ Inec na akọrọngwa ntuliaka. ""Ị gaghị asị na ọ bụ onye ọzọ batara,ọ bụ ndị be anyị na-emekwa onwe anyị."" E wezụga ịgba ụlọọrụ Inec ọkụ, i nwetacha ụfọdụ okwu a na-ekwu na soshal midia, megide ntuliaka ahụ, ị mara na ihe na-eme anyị si anyị n'aka. ""ihe na-eme anyị si anyị n'aka, Ọ bụ oke nọ n'ụlọ gwara oke nọ n'ọhịa na-azụ dị na ngịga."" Orakwe rụturu aka na ihe so bute isu ụlọọrụ Inec ọkụ bụ ""etu obodo si mebie."" Ekemezie bụ onye ọzọ ọnụ na-eru n’okwu kwuru na ụta dịrị Inec nakwa ndị ọrụ nchekwa maka mwakpoo nile na-eme n'ụlọrụ Inec. OỌ k;pọrọ oku ka Inec ghara iji maka ọdachi ndị a mere gba ọnyụpa n'ihu na e wepụtara PVC ọhụụ were dochie ndị mebiri tupu ntuliaka 2023. N’uche ya, Inec zuru ka e mee n’ihe gbasara nchekwa ngwa ọrụ ha nakwa ịdoghachi ndị lara n’iyi na mwakpo awakporo ụfọdụ ụlọọrụ ha. \nMana n’aka ọzọ ọ tara ndị ọrụ nchekwa ụta ma na-ajụ ihe mere ha ejighi enye Inec nkwado kwesiri n’ụzọ nchekwa. \nỌ jụrụ sị, “Isi ụlọọrụ Inec na-adịkarị nso n’ụlọọrụ ndị uweojii, kedụzia ihe mere na ndị uweojii anaghị enyocha ka ihe ndị a si eme ma na-agba mbọ ịnwụchi ndị aka ha dị namwakpo a?” Ọ bụghị naanị n'Ọwụwa-Anyanwụ ka a wakporola ụlọọrụ Inec na nsonso a, dịka n'abalị 10 nke ọnwa Novemba afọ 2022, a wakporo ụlọọrụ ha na Ogun nakwa Osun steeti bụ ebe a gbara ụlọọrụ Inec dị n' Abeokuta, Ogun State nakwa Ede-South, Osun Steeti. Mana mwakpo e merela n'Ọwụwa Anyanwụ kachasị karịa mpaghara ndị ọzọ. Kemgbe ọnwa Mee afọ 2022 bụ mgbe Peter Obi ghọrọ onye ga-azọrọ ndị 'Labour Party' ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 dịka ọ hapụchara otu PDP. Kama ịdajụrụ kemgbe Obi pụtara, mwakpoo ụlọọrụ ndị Inec nke chaliri n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021, malitere rịwa elu. Lee ụfọdụ ebe ndị ọ kọtụọrọla n'Ọwụwa Anayanwụ: N'ụbọchị Tọzde, abalị mbụ nke ọnwa Disemba, 2022, ndị omekome wakporo ụlọọrụ Inec n' Ọlụ dị n'otu Imo steeti ahụ. N'abalị 27 nke Ọnwa Novemba afọ 2022, ndị omekome wakporo ụlọọrụ Inec na Izzi dị n'Ebonyi steeti sunye ya ọkụ. Okụ ahụ gbara igbe vootu (ballot bọx) dị 340,igwe na-enye ọkụ latrik 14 nakwa akwụkwọ atụmvootu a mabeghị ọnụ ọgụgụ ya. Ndị omekome wakporo ụlọọrụ Inec dị n'Okpuru Ọchịchị Igboeze-North dị n'Enugwu steeti n'ọnwa Julai, gbaa ụlọọrụ ahụ ọkụ ma mebie akọrọngwa ọrụ ntuliaka dịka igbe vootu, mkpukpu a na-anọ atụ vootu nakwa oche na tabulu ụlọọrụ ahụ. Ndị omekome wakporo ma sunye ụlọọrụ Inec n'Okpuru Ọchịchị Eze Ezza-North nakwa nke ndị n'oOkpuru Ọchịchị Izzi ọkụ n'ụbọchị Tuzde,abalị 18 nke ọnwa Mee, afọ 2022. Oku ahụ mebiri igwe na-enye ọkụ, igbe e ji atụ vootu na akọrọngwa ntuliaka ndị ọzọ n'ebe ndị a." https://www.bbc.com/igbo/articles/cd10z52k1v8o +business Port Harcourt Airport: Agbapeela ụlọ nlabata ọhụrụ Akụkọ dị mkpa taa Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ndị chịburu achị mara afọ n'ala na nwulite ọdọụgb���elu na Naịjirịa kamgbe afọ 1980. O kwuru nke a mgbe ọ na-agbape ngalaba ọhụrụ nke ọdọụgbọelu mbaụwa dị n'Omagwa Portharcourt nke Rivers Steeti taa. Okorocha a saala APC Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na onye odeakwụkwọ mgbasa ozi pati APC bụ Lanre Issa Onilu ezipụla ozi ọjọọ banyere APC na mbaụwa. Okwu a bụ na nzaghachị okwu Issa kwuru na ụfọdụ ndị gọvanọ APC anabataghị mmeri e meriri ha na ntuliaka imeụlọ ha mere na nso nso a. Ezigala ozi ogbunigwe ọzọ n'ụlọ oriri Tribeca Grill dị na New York nke onye nwe ya bụ De Niro. Nke a bụ mmadụ itoolu ndị akụkọ kwuru na-akatọọ ọchịchị onyeisiala Trump a na-ezigara ụdị ozi a n'ime otu izuụka. N'asọmpi Europa nke abalị a Sporting Lisbon ga-ele Arsenal ọbịa, ebe Chelsea ga-anabata ndị Bate Borisov. N'aka nke ọzọ Zenit St Petersburg, Dinamo Zagreb, Bayer Leverkusen na ndị ọzọ ga-anọ n'egwu. Gọọmentị etiti ekewapụtala ego ruru tarịị naịra asatọ n'ọma bu ego a ga-emefu n'afọ 2019 dịka bọjeti. Minista na-ahụ maka nhazi nakwa bọjeti bụ Udoma Udoma ekwuola na ya bụ akwụkwọ na-aga n'ụlọomeiwu maka nyocha ugbua Minista na-ahụ maka mgbasa ozi Lai Mohammed etiela mkpu n'akụkọ na-agagharị na-ekwu na ya ndị mba Israel na-ama aka gbasara Nnamdi Kanu abụghị eziokwu. Ọ sị na ndị ọ gbasara ga-ezi ozi n'okwu Nnamdi Kanu ma oge ruo. Na mba ofesi, Mba Saut Afrịka ewepula ụgwọ ụtụ isi dị n'elu akwa ụmụnwaanyị ji anọ na nsọ iji nyere nwata akwụkwọ ndị nwaanyị aka ka ha kwụsị ịgbajọ ụlọakwụkwọ. Cheta na ụfọdụ ndị ntorobia na Naịjirịa na-akpoku gọọmentị etiti oku ka ha wepu ya bụ ụtụ isi. N'Egwuregwu, Otu egwuregwu Rangers abụrụla aha na-ewu ewu ugbua dịka ha meriri Kano Pillars n'Asaba ụnyaahụ iji buli asọmpị iko FA nke mbụ ha n'afọ iri atọ n'anọ Ndị kpara ike a bụ Kelvin Itoya Chidera Ezeh Ajani Ibrahim na n dị ọzọ. Gee Nkeji nke ụtụtụ a Ihe onyonyo nke taa https://www.bbc.com/igbo/afirika-45967479 +entertainment Patience Ozokwor: Adị m iche n'ihe ị na-ahụ n'ime onyonyo Patience Ozokwor bụ ome ihe onyonyo ama ama na-akọwa na ọbụghị ihe niile mere n'ime onyonyo bụ nke ezie. Ọ gwara anyị ihe ndị dị icheiche bụbu aka ọrụ ya tupu obido ime ihe onyonyo. Nke a bụ nke mbụ n'ime mkparịtaụka anyị na ya nwere, ndị ọzọ ka naabịa. Dịrị njikere. https://www.bbc.com/igbo/media-44946245 +religion Fr Raymond Arazu: Fada Katọlik a bụkwa Dibịa anwụọla "Otu Fada ụlọụka Katọlik aha ya bụ Raymond Arazu anwụola n'ụlọọgwụ dị n'Enugwu. Onye ọdeakwụkwọ ụlọụka ahụ wepụtara ozi a kwuru na e bugara ya ụlọọgwụ dịka ike na-agwụ ya n'ụbọchị ole na ole gara aga. Ozi ahụ kwuru na ọ na-arịabu ọrịa akpụ nke ngada nakwa Dayabitis tupu ọ nwụọ. Ha kwukwara na a ga-ewepụta ozi ma ahazicha usoro akwamozu ya. Tupu ọ nwụọ, ọ bụ onyeisioche otu ndị mgbọrọgwụ akpọrọ ""Anambra Traditional Medicine Board"". Fr. Arazu bụ otu onye ya na ụka ya na-akwata isi maka ọtụtụ ihe gbadoro ụkwụ n'omenala Igbo. Ọ kpọrọ onwe ya ""Dibia"" ma na-emekwa ihe gbasara mgbọrọgwụ Igbo. Ọ bụkwa onye akpọrọ ""Holy Ghost Father"". E kwukwara na ọ na-achụpụ ajọ mmụọ bi n'ime mmadụ nke Bekee kpọrọ ""Exorcist""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59796462 +health No Bra Day: Gini ka ụbọchị a pụtara? "Dịka ọ na-ewu n'ebe niile, ọtụtu ndị mmadu nwere nghọtaghịe ihe ụbọchị a bụ maka ya. Etu ụbọchị a siri Bido Dịka ndị otu Cancer.ca siri kọwaa, ọ bụ Dọkinta Mitchell Brown bịdoro ụbochị a i ji mepee anya ndị mmadụ maka ihe gbasara ọrịa kansa n'afọ 2011. Brown kpọrọ ya 'BRA Day' nke pụtara ""Breast Reconstruction Awareness Day"". #NoBraDay: Ọ ga-akwụsị ọrịa kansa n'ụmụnwanyị? Ebum n'obi Brown bụ ị kụziri ụmụnwaanyị ndị a ga-awa ara maka ọrịa kansa na ha nwere ikike ị sị ka awa ha ara ma meekwa ya ka ọ dị mma . Nke a ka ndị Bekee na-akpọ 'Reconstructive Surgery'. Afọ atọ ka ọ were ka emume a gazụọ mba iri atọ. Ka oge na-aga ka atụghaghịrị aha ụbọchị a site na BRA DAY ọ bụrụzia No BRA Day, nke mere ka ọtụtu ndị mmadụ aghọtaghe ya. Ọ na eme Nwoke na Nwanyị kama ọkacha eme ụmụnwanyị ebe ihe pekarịrị 1% n'ime ụmụnwaoke (Dika Nna Beyounce Knowles bụ Mathew Knowles) otu narị na-enweta ya. Otu ihe ikwesiri ime i jị gbochie Kansa Ara Enwere ụzọ abụo esi achọpụta ma mmadụ enwere Kansa ara. 2. Nke abụọ bụ ịga ụlọ ọgwụ ka ha nyocha ara gị Nwaada a na-akọwa na ọ bụ ụbọchị maka Kansa Ara na ọ bụghị maka ịgba ọtọ Nwaada a na-egosi ụmụnwanyị etu ha ga-esi nyocha onwe ha maka kansa ara." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50032212 +health Coronavirus: Ihe ise mba ụwa kwesịrị ịmụta n'aka Naịjirịa Ọrịa coronavirus agbasaala na mba 114 n'ụwa kamgbe ọ malitere n'obodo Wuhan nke mba Chaịna. Naịjirịa sokwa na mba ebe ọrịa batarala. Oge nwoke onye Itali bubatara ọrịa na Naịjirịa, egwu tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n'ihi na ha che na gọọmentị agaghị enwe ike igbochi mgbasa ya bụ ọrịa Mana gọmentị Naịjirịa akpaala ike igbochi mgbasa ọrịa ọjọọ nke mere ka otu ahụike mbaụwa bụ 'World Health Organisation' weliere ha aka elu. 'Genome sequencing' Naịjirịa bụ mba izizi n'Afrịka mere ihe a kpọrọ 'genome sequencing' nke gosiri na nje ahụ bụkwa ụdị nje nke na-agbasa na mba Itali nakwa obodo Wuhan. Ngalaba mgbochi ọrịa bụ 'National Centre for Disease Control' kwuru na ndị nyere aka ime nke a bụ ndị mịnịstrị ahụike nke Legos steeti. Ha kesara ihe ha chọpụtara na nchọpụta a nye ndị ọrụ ahụike n'akụkụ ụwa niile. Onyeisi WHO kelekwara ndị ọkammuta sayensị Naịjirịa maka nke a. Mgbasa ozi Ụlọọrụ mgbasa ozi a tụkwasịrị obi dịka BBC na-agbasara ndị ọha obodo ihe niile ha kwesịrị ịma nakwa ihe ha kwesịrị ime iji zeere ọrịa ọjọọ a. Kwa ụbọchị, ụlọọrụ ntaakụkọ dị icheiche na-ewepụta akụkọ iji kuziere ndị mmadụ ihe ha ga-eme ma ha hụ onye na-arịa ọrịa yiri coronavirus. Ịchọta ndị niile ha na onye mbụ bu ọrịa a mekọrọ Gọọmentị Naịjirịa chọtacha ndị niile ha na nwoke Itali ahụ bubatara ọrịa coronavirus bakọrọ ụgbọelu. Na-agbanyeghị na ọtụtụ n'ime ndị ahụ anọghị na Legọs, gọọmentị kpọtụụrụ ha niile ma dọọ ha aka na ntị ihe ha ga-eme. Ọgbakọ onyoonyoo kama ọgbakọ ihu na ihu Dịka gọọmentị mara ọkwa na ọrịa coronavirus abatala Naịjirịa, ọtụtụ ụlọọrụ machiri inwe ọgbakọ ihu na ihu, kama ha malitere iji ịntaneetị enwe ọgbakọ n'igwe televishọn. Nke a belatara mmekọrịta ahụ mmadụ na ibe ya, nke bụ otu ụzọ ọrịa a si agbasa. Itinye ihe karịrị mmadụ 100 na 'quarantine' Na mkparịtaụka ya ndị ntaakụkọ n'abalị abụọ nke ọnwa Maachị, Kọmịshọna ahụike na Legọs steeti bụ ọkammụta Akin Abayomi kwuru na ha etinyela ihe karịrị mmadụ 100 na kwarantaịn. Ndị a bụ ndị ha na nwoke Ịtalị ahụ bubatara ọrịa coronavirus mekọrịtara ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51874222 +sports Nigeria vs Tunisia live: Ugo Tunisia atụkpọọla nke Nigeria otu anya "Ndị 'Super Eagles' nke Naijirịa nọ n'ụzọ ụla ugbua dịka 'Carthage Eagles' nke mba Tunisia ji otu goolu merie ha n'agba nke 16 nke Africa Cup of Nations (Afcon). Na nkeji 47 e ji malite ọkara nke abụọ, Youssef Msakni nke Tunisia ji goolu dọkaa neetị, nke tinyere ndị Naịjiria na gbagharịa. N'egwuregwu ha malitere ebe elekere asatọ nke abalị Sọnde a bụ Jenụwarị 23, 2022, otu abụọ a nwara ike ha mana goolu jụrụ ịba n'ọkara nke mbụ. N'agbanyeghi na Naịjiria nwetara 'corner kick' anọ n'ọkara nke mbụ, enweghi nke rutere nso ịbanye na poostu. Ka ọ kwụ ugbua, ndị Naịjiria kwụ n'akụkụ, chịrị obi n'aka iche ihe ekwe ga-akụtara ha mgbe a ga-egbuchi bọọlụ. Super Eagles nọ n'elu tebulu Otu D ka ha merichara Egypt otu goolu asataghị ihe ọbụla, merie Sudan nakwa Guinea Bissau. Ha bụ otu egwu bọọlụ natara pọịntị itoolu n'agba ndị otu n'Afcon nke afọ a. Otu egwu bọọlụ Tunisia gbara atọ n'otu F ma ruo ogo 16 dịka ndị na-achịtagh iihe ọbụla n'otu ahụ. Naanị otu egwu ka ha meririla n'Afcon 2021 tupu ha agbapụ Naijirịa.. Naịjirịa maọbụ Tunisia merie egwu a, Gịnị ga-eme? Dịka o siri dị ugbu a, Tunisia abanyela n'agba anọ nke ikpeazụ (quarter-final) ebe onye achịtaghị aja ga-akwara ngwongwo ya lawa. Nke a ga-abụ ugboro iri abụọ n'otu Naịjirịa na Tunisia na-ezute onwe ha n'asọmpi bọọlụ. N'ime asọmpi iri abụọ ha gbarala, Naịjirịa emeriela Tunisia ugboro ise, ebe Tunisia merikwara ugboro ise. Ugboro iri ka ha gbarala onwe ha onye lawa onye lawa. Asọmpi nke afọ a ga-abụkwa nke ugboro asatọ Naịjirịa na Tunisia na-ezute onwe ha n'asọmpi Afcon. N'ime asọmpi ndị a, Naịjirịa meriri ugboro anọ, Tunisia merie naanị otu ugboro, ebe ha gbara nhatanha ugboro abụọ. Oge ikpeazụ Naịjirịa na Tunisia zutere bụ n'asọmpi bọọlụ enyi na enyi ha bgara n'afọ 2020 ebe ha nyere onwe ha otu goolu otu goolu Ndị otu Super Eagles nke Naịjirịa gbara nnọọ nke ọma n'agba nke mbụ nke asọmpi Afcon 2021. Ha meriri asọmpi atọ niile ha gbara n'agba nke mbụ nke asọmpi a. Naịjirịa meriri Ijipt 1-0, merie Sudan 3-1, bịakwa merie Guinea-Bisau 3-0. N'aka nke ọzọ, ndị Tunisia meriri naanị otu asọmpi n'ime asọmpi atọ ha gbara n'agba nke mbụ nke Afcon afọ a Mali meriri ha 1-0, ha emerie Mauritania 4-0, mana Gambia merikwara ha 1-0. Nke a pụtara na ọ bụ ọnyụpa ka Tunisia ji malite asọmpi Afcon nke afọ a. Mana ndị ma ihe ekwe na-akụ n'egwuregwu na-ekwu na-asọmpi Naịjirịa na Tunisia na-atakarị akpụ oge niile. N'ime asọmpi atọ Naịjirịa gbara n'agba nke mbụ Afcon 2021, ha dị mmadụ atọ chakere ka kpakpando nke ewu na ọkụkọ hụrụ ma kweta. Mmadụ atọ a ritere nturugo Bekee kpọrọ ""Man of the match"", n'ihi etu ha si gbaa bọọlụ ọfụma ma nye goolu. Iheanacho bụ onye mbụ ritere nzere 'man of the match' n'asọmpi Naịjirịa na Egypt. Ọ bụ ya nyere goolu Naịjirịa ji nweta mmeri na asọmpi ahụ. Nwa amadi a dị afọ iri abụọ na ise, ma bụrụkwa onye otu bọọlụ Leicester City nke mba England. Iheanacho esoghi gbaa asọmpi Afcon nke afọ 2019, n'ihi na onye nchịkọta nọ oge ahụ bụ Gernot Rohr, echeghị na ụkwụ ruru ya ịgba. Mana ọ chakere ka kpakpando n'afọ a nke mere onye nkuzi nọ ugbua bụ Augustine Eguaveon ji kpọọ ya. N'afọ 2013, oge ọ dị afọ iri na asaa, Iheanacho duuru ndị otu bọọlụ Naịjirịa U-17 buo iko mba ụwa nke a gbara na mba United Arab Emnirates. Ọ bụ Iheanacho kacha nye goolu ma bụrụkwa onye kacha gbaa bọọlụ nke n'asọmpi ahụ. Nwa amadi a dị afọ iri abụọ na ise na-agbara otu bọọlụ FC Nantes na mba Fransị. Ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ ya ka ụkwụ kacha aghọ nkọ n'ime ndị 'Super Eagles' kamgbe asọmpi Afcon a malitere. Moses Simon enyela otu goolu, ma nyekwara mmadụ abụọ ọzọ aka inye goolu. Ndị o nyeere aka ka ha nye goolu bụ Samuel Chukwueze na William Troost Ekong. Ọtụtụ ndị nkwado Naịjirịa na-ekwu na Moses Simon na-agba bọọlụ dịka Lionel Messi nke mba Argentina. Ọ bụ eziokwu na nwa amadi a na-agba azụ maọbụ 'defence' na bekee, o gosila na ọ ma ka e si enye goolu. Ekong nyere goolu nke abụọ na mmeri Naịjirịa meriri Guinea Bisau. O ritekwara nturuugo 'man of the match' n'asọmpi ahụ. William Troost-Ekong so na ndị mere na enyebeghị Naịjirịa ọtụtụ goolu n'asọmpi Afcon afọ a. Ndị ọzọ atụkwasara obi na ha ga-emenye ndị Tunisia Ọ bụ eziokwu na mba ndị si Nọt Afrịka eyiela Naịjirịa egwu ọtụtụ ugboro n'asọmpi Afcon. Mana ọtụtụ kwenyere na Naịjirịa ga-ememina Tunisia n'ọgbọ a. Lee ndị enwere olileanya na ha ga-eyi ndị Tunisia egwu ma oge ruo: Chukwueze so ndị otu bọọlụ Naịjirịa U-17 buo iko mba ụwa n'afọ 2015, na mba Chile. Ugbua, nwa okorobia a dị afọ 22 na-agbara ndị otu Villareal nke mba Spen. O so na ndị ụkwụ na-aghọ nkọ ugbua n'otu egwu 'Super Eagles'. Awoniyi ọ dị afọ iri abụọ na anọ, bụrụkwa onye otu egwu Union Berlin nke mba Jamịnị. Nwa amadi a so na ndị otu U-17 butere iko mba ụwa n'afọ 2013. Awoniyi nyere otu n'ime goolu atọ Naịjirịa ji merie Sudan n'asọmpi Afcon a. Ndị mmadụ na-ekwu na asọmpi Afcon 2021 bụ ohere Awoniyi nwere iji gosi ihe o nwere ike imenwu na 'Super Eagles'. N'asọmpi atọ Naịjirịa gbarala na Afcon afọ a, Aribo egosila na ọ bụ odogwu n'egwu etiti. Aribo nọ otu egwu Rangers na mba Scotland, ebe o so ha buo iko bọọlụ mba ahụ n'afọ 2020. Ọ bụ onye ọtụtụ mmadụ kwenyere na ọ ma ihe ekwe na-akụ n'egwu bọọlụ." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-60065915 +sports Sam Okwaraji: Ihe agaghi eji chefuo nwaafọ a "Taa ka o mere afọ iri atọ na otu (31) ọkwụrụ aka ndị Igbo nwere n'egwu bọọlụ bụ Sam ọkwaraji dara n'ọgbọ egwuregwu nwụọ. Ụbọchi 12 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1989 bụ oge Sam Okwaraji gara ọgụ ikpeazụ ya. Ọgụ Okwaraji abụghị nke e ji mma na egbe alụ, ọ bụ n'ama egwuregwu, mana e ji uwe egwuregwu Naịjirịa lụọ ya. N'ụbọchị ahụ Okwaraji dara, ọ fọrọ naanị nkeji 30 ka a gbachaa bọọlụ ahụ Super Eagles na Angola na-agba iji ahọpụta ndị ga-aga Iko Mbaụwa nke afọ 1990. E buru ya gawa ụlọọgwu ebe ndị dọkịnta sị na ọ nwụọla. Ihe Okwaraji ji bụrụ ọpụrụiche Ndị amaghị maka ya nwereike na-asị na ọ bụ sọsọ ọgba bọọlụ mana ọ bụ sọsọ ihe ọ na-eme n'ama egwuregwu ka e ji mara nwaamadị a? A mụrụ Okwaraji n'ụbọchị 19 nke ọnwa Mee 1964 n'Owere-Umudioka dị n'okpuruọchịchị Orlu dị n'Imo steeti. Ebe ọtụtụ ndi na-agba bọọlụ adịghị abụ ndị na-agụsi akwụkwọ ike, Okwaraji ji asambodo ọkammụta n'ihe banyere ịbụ ọkaiwu. Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum dị n'obodo Rome dị na mba Itali. A ma ya ka onye hụrụ mba ya n'anya ọfụma, nke mere ọtụtụ oge ọ na-agbara onwe ya ụgbọ gaa ebe ọ ga gbara Naịjirịa bọọlụ. Okwaraji gbaara Naijirịa bọọlụ ugboro asatọ ma nye otu goolu. Mgbe otu egwuregwu bọọlụ ọ na-agbara bọọlụ mgbe ahụ sị na ọ gaghị agara Naịjirịa asọmpi, Okwaraji sara ha okwu mere ọtụtụ mmadụ jiri kpupuru ya okpu. Ọ sị; ""Abụ m ọkaiwu. Dịka unu ma, ebinyere m aka ịgbara unu bọọlụ, mana echeghị m na ọ ga-egbochiri m ịza oku obodo m. Unu agaghị akwụsị m ịgbara mba m bọọlụ. Ka m gwa gị, aga m aza oku mba m ma unu achọrọ ya, ma unu achọghị ya."" Na nkwanyeugwu, gọọmentị Legọs hibere nka Okwaraji n'afọ 2011 n'ama egwuregwu ebe ọ nọ lụọ ọgụ ikpeazụ ya; National Stadium nke dị na Surulere. Aka chịburu Imo Steeti bụ Achike Udenwa, gụkwara ama egwuregwu dị n'Orlu, Imo steeti bụ obodo o si, aha Okwaraji iji cheta ya. Ndị egwu jikwa aha ya gụọ egwu. Ihe gburu ya bụ ọrịa obi. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasịkwa gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49316330 +sports Super Falcons agafeela agba nke abụọ ka Thailand tunyere ha azụ "Super Falcons nke Naịjirịa ga-ezute otu egwueregwu bọọlụ ụmụnwaanyị nke Jamanị n'obodo Grenoble ụbọchị Satọde n'agba nke abụọ asọmpị Bekee kpọrọ 2019 ""Women's World Cup"". Super Falcons tozuru iso n'agba nke abụọ ka Chile ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Thailand, nke nyere ya ohere ịbanye ụgbọ dịka ha turu ugo ọkamma na ndị ikpeazu. Ọ bụ na Monde bụ ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Juun ka Falcons sụrụ mpị nke ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa na-asị na VAR napụrụ ha mana omere abalị atọ iji chọpụta ka ha a ga-etuozu ịga agba nke abụọ. Dịka agbachaala asọmpi niile dị n'agba nke mbụ, Falcons pụtara dịka nke kachasị mee ọfụma na ndị achịtaghị aja nke ga-enye ohere itozu gaa agba nke abụọ. Ọ bụ otu egwuregwu atọ na-agafe dịka nke ka mma na ndị ikpeazụ. Kameroon bụ mba ọzọ n'Afịrịka ritere uru a ụnyaahụ. Dịka ha mere ụfọma n'asọmpị ha na Frans, ọtụtụ ndị na-akwado ha nwere olilanya na ha ga-agba mbọ na agna nke abụọ a." https://www.bbc.com/igbo/afirika-48701338 +health Coronavirus in Nigeria: Lee azịza ajụjụ ndị na-anụ gị ọkụ n'obi Akụkọ maka ọrịa Coronavirus ịbata na Naịjirịa abụghịzị akụkọ ọhụrụ, mana mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa ekwuola ka obi ghara ịmapụ onye ọbụla. Dịka ọrịa a na-efesa n'akụkụ ụwa niile, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ya bụ ọrị na-agbasa n'ikuku, nke Bekee kpọrọ 'airborne disease'. Mana nke a abụchaghị eziokwu. Lee azịza niile otu ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) nyere gbasara ọrịa coronavirus. Coronavirus bụ ezinaụlọ nnukwu nje na-ebute ọrịa nke gụnyere oyi nkịti nakwa ọrịa ndị ọzọ. Ọrịa ndị ọzọ si n'ezinaụlọ coronavirus a bụ Severe Acute Respiratory Syndrome bụ SARS n'ịchafụ (nke si na buusu malite) nakwa Middle East Respiratory Syndrome bụ MERS n'ịchafụ (si na Kamel), mana amabeghi ebe nke ọhụrụ a si malite. COVID-19 bụ aha a gụrụ ọrịa coronavirus ọhụrụ nke si n'obodo Wuhan dị na mba Chaịna malite n'ọnwa Disemba 2019. Ị nwere ike ibute ọrịa a site n'aka onye bu ya. Ọ bụrụ na onye bu ọrịa a maa uzere maọbụ kwaa ụkwara, nje ahụ nwere ike ịdakwasị n'elu ihe ụfọdụ. Onye ọzọ metụ ihe ndị ahụ nje dakwasara aka ma tinyekwa aka ahụ n'anya, n'ọnụ maọbụ n'imi ya, nje ahụ efeela ya. Mmadụ nwekwara ike ikute ọrịa a n'ume ma ọ bụrụ na o kuru ume onye bu ọrịa a mapụtara n'uzere maọbụ kwapụtara n'ụkwara. Ya mere, ọ dị mkpa ka ị nọtee onye ọbụla na-arịa ọrịa aka ihe ruru nzọụkwụ atọ ma ị kwụrụ n'akụkụ ya. Otu WHO ka na-emekwa nnyocha iji chọpụta ma o nwere ụzọ ọzọ ọrịa a si agbasa na-abụghị ụzọ ndị e depụtara ebe a. Ihe ndị kacha agba ama ọrịa a bụ ahụọkụ, ike ọgwụgwụ nakwa ụkwara nta. Dịka WHO si kwuo, ụfọdụ ndị mmadụ na-enwekwa ahụ mgbu, azụzụ, ọnya akpịrị nakwa afọ ọsịsa, ụfọdụ bụkwa ndị ọ na-ara ahụ iku ume. Ha kwukwara na ọ bụghị mmadụ niile bu ọrịa a na-egosiputa ihe mgbaama niile a, ebe ọ na-abụghị mmadụ niile na-anata ọgwụgwọ tupu ha agbakee. Ha kwuru na ọrịa a kacha emekpa ndị agadị nakwa ndị nwere ọrịa dịka ọbara mgbalielu, ọrịa obi maọbụ ọrịa shuga, ahụ. Gbado anya n'ihe ekwe na-akụ gbasara ọnọdụ ọrịa a site n'ọbaozi ndị kwesịrị ntụkwasị obi maka ntaakụkọ. Ndị dịka WHO, mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Naịjiria nakwa mịnịstrị ahụike nke ebe i bi. Ihe ndị ọzọ ị ga-emenwu gụnyere: Na gburugburu mbaụwa niile, ọrịa coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ puku abụọ na narị asatọ. Ihe ruru mmadụ puku iri asatọ bukwa ya bụ ọrịa ugbua. Mana oziọma dị na ya bụ na ihe ruru mmadụ puku iri atọ esila na ya bụ gbakee. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51665154 +business Lagos Airport: Ndị njem tọrọ na MM2 ka ndi ọrụ na-eme ngagharị iwe "Ụkwụ tọrọ ọtụtụ ndị njem ụgbọelu n'ụzọ dịka ndị otu ndịọrụ ụgbọelu dị ise kpochiri ọdọụgbọelu Muritala Muhammed nke abụọ (MM2) n'ụbọchị Wenezde iji gosi iwe maka ndị otu ha mmadụ 20 a chụrụ n'ọrụ. Ụlọọrụ Bi-Courtney Aviation Services Limited (BASL), ndị na-achịkọta ọdọụgbọelu MM2 chụrụ ndị ahụ n'ọrụ na mbido afọ 2018. Ndị otu ndịọrụ na-akpa ike ahụ gụnyere; otu National Union of Air Transport Employees (NUATE) ; Air Transport Services Senior Staff Association of Nigeria (ATSSSAN), nakwa 'National Association of Aircraft Pilots and Engineers (NAAPE).' Ha egeghị n'iwu ụlọikpe nyere nụbọchị Tuuzde ka ha ghara igbosa ka o si aga n'ọdọụgbọelu ahụ dịka ụlọọrụ Bi-Courtney gbara ha akwụkwọ n'ụlọikpe. Otu onye na-arụ n'ọdọụgbọelu gwara BBC Igbo na ""otu jịkọrọ ndị ọrụ na-eme nghariiweagba abụbọ ọrụ."" Ọnụ na-ekwuru otu ndị ọrụ ahụ ngalaba nke Legọs bụ Anthony Ijeh gwara BBC na 'ihe mere bụ na ndị ụlọ Bi-Cortney achọghị ka ndị ọrụ ha bụrụ ndị otu anyị."" Akụkọ ga-amasị gị" https://www.bbc.com/igbo/afirika-45807483 +business UBA Sack: Ọchụchụ anyị biara na mberede - Onye ọrụ UBA """Ọ bụ mgbe m rụchara ọrụ n'ụbochi Fraide ka a kpọrọ anyị were sị anyị dee akwụkwọ arụkwaghị m"" etu, otu Josephu Agumadu( ọ bụghị ezi aha ya) onye ụlọọrụ 'United Bank for Africa' (UBA) a chụrụ n'ọrụ na nso nso siri nata ozi na a chụọla ha n'ọrụ. Agumadu, onye gbara BBC Igbo ama na ya arụọla ọrụ n'ụlọakụ afọ iri na abụọ dịka onye na-ata ego (teller) so na mmadụ puku anọ ụlọakụ UBA churu n'ọrụ n'afọ ọhụrụ a. Mana kama ikwu maka ndị ha chụrụ n'ọrụ, ụlọakụ UBA na-akụ ekwe mmadụ 4000 ha were n'ọrụ n'akara igwe okwu Twitter ha: Nwoke , onye gbara ama na ya ji asambodo 'OND' banye n'ọrụ ahụ ma mechara nweta B.Sc kwuru na ""ọtụtụ ndị a chụrụ n'ọrụ bụ ndị 'Teller'"". ""Anyị dịbu 'teller' atọ, a kpọtara ndị teller ọhụrụ atọ kemgbe ọgw ụgwụ afọ ha soro anyị na-arụkọ. Nwoke ahụ onye kwuru na ya bidoro nyowa agwa a na-akpaso ha dịka e wetara ndị ọhụrụ n'ọgwụgwụ 2019 ma gbaa mbọ ịhụ na ha kuziere ha ọrụ tupu af ọ gara aga agwụ. ""Onyeisi nlekọta anyị na-ekwukarị 'bido n'ọnwa Janụwarị."" ""Ọ bụ ka ihe mere ka anyị matara nebunobi ha bụ iji ndị a anyị kuziri ọrụ dochie anyị."" Dịka ọchụchụ n'ọrụ metụtara ọtụtụ ndịọrụ nọ n'alaka UBA dị n'akụkụ Naijiria dị iche iche, ụlọakụ ahụ buliri ụfọdụ dị mmadụ n'ọkwa, ebe ha tinyere ego n'ụgwọọnwa . Agumadu kwuru na ha kwụrụ ya ụgwọ ọnwa isii dịka ego laba ezumike mana ọchụchụ n'ọrụ a dara ya na mberede mere Naijiria dị ya ka Ghana. Ọ gwara BBC sị, ""Ka o dị ụgbụ a, amaghịzị m ihe ọzọ m ga-eme""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51000889 +religion Mbaka agọziela Peter Obi ma rịọ ndị nkwado ya mgbaghara "Ụkọchukwu Katọlik a ma ama n'Enugwu Steeti bụ Ejike Mbaka arịọla aka chịburu Anambra Steeti bụ Peter Obi mgbaghara maka nkatọ ọ katọrọ ya n'abalị olemole gara aga. Mbaka rịọrọ mgbaghara a n'akwụkwọ ozi o wepụtara site n'akara Facebook ya n'ụbọchị Fraịde. O kwuru na ọ bụ nghọtahie ka ndị mmadụ ghọtahiere ihe o kwuru. ""N'ụzọ ọbụla ụnụ si ghọtahie m, maọbụ etu ọbụla m si mejọọ, biko ghọtanụ ma gbagharanụ m,"" Mbaka kwuru. Cheta na Mbaka kwuburu na ""enweghị ebe Peter Obi ji azụ aga n'okwu gbasara ịbụ onyeisiala Naịjirịa na 2023"". O kwuru nke a n'ọgbakọ ekpere nke 'Adoration Ministry' nụbọchị Wenezde, abalị iri na ise nke ọnwa Jun 2022. N'akwụkwọ ozi ya, Mbaka kwuru na ya na-ekpere Peter Obi ekpere ka uche Chineke mezuo n'isi ya. ""Ebumnuche m abụghị iluso Peter Obi ọgụ maọbụ kọtọọ ya."" ""Ọ bụ enyi m ma bụrụkwa nwanne m nwoke. Ahụrụ m ya n'anya, ma na-ekpekwara ya ekpere ọma."" ""Ana m agọzi Peter Obi na ndị na-akwdo ya."" ""Ana m agọzikwa ndị ọzọ niile na-azọ ọkwa onyeisiala nakwa ndị nkwado ha."" ""Ana m ekwe mmadụ niile nkwa na ana m ekpe ekpere ka Chineke nye anyị ezi ndị ndu na Naịjirịa ndị ga-eme uche ya."" Mbaka gara n'ihu kwuo na ya anọghị n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla, kama ya na-akwado onye ọbụla ga-eweta ọchịchị ọma na Naịjirịa. ""Ihe na-agụ m agụụ oge niile bụ ka Naịjirịa pụta n'ụbịam na ihe isi ike na-echere ọtụtụ mmadụ aka mgba,"" Mbaka kwuru. ""Ka Chineke nyere anyị aka."" Fr Ejike Camillus Mbaka bụ ụkọchukwu Katọlik na-arụ ọrụ na Dayọsis nke Enugwu, na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Ọ bụkwaya ya bụ onyeisi ụlọ ekpere a na-akpọ 'Adoration Ministry Enugwu, Nigeria' (AMEN). E chiri ya ụkọchukwu n'ọnwa Julaị nke afọ 1995, nke pụtara na ọ rụọla ọrụ dịka ụkọchukwu ihe ruru afọ 27 ugbua. Otu ihe e ji mara Mbaka bụ na ọ na-ebukarị amụma gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, ntuliaka, nakwa ndị ga-emeri ntuliaka. N'afọ 2020, Mbaka buru amụma na Hope Uzodinma ga-arigo n'oche Gọvanọ Imo Steeti. O buru amụma a na-agbanyeghị na Emeka ihedioha bụ Gọvanọ Imo Steeti n'oge ahụ, dịka okwu ntuliaka ya kadị n'ụlọikpe. Ulọikpe kachasị na Naịjirịa mechara chụtuo Ihedioha ma kwuo na ọ bụ Hope Uzodinma meriri ntuliaka ahụ. Mbaka bukwere amụma na Buhari ga-emeri Jonathan na ntuliaka nke 2015, Amụma a bịakwara na mmezu. Mana n'afọ 2020, Mbaka mechara katọọ ọchịchị Buhari." https://www.bbc.com/igbo/articles/cv27mgy4lv7o +sports Sports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa egwuregwu Ndị na-agba chaa chaa na-asị na 'e tinye okwe e rie okwe, onye ụjọ ababa' mana ha amaghị ọghọm dị na ya. Nyocha BBC mere na mba Yuganda gosiri na ego ndị na-agba chaa chaa na-etinye na-akarị nke ha na-erite. Nke mere gọọmentị mba ahụ na-achọ ụzọ ha ga-eji ebelata ụmụokoroọbịa ị na-agba chaa chaa. Kirie ka ị hụ mpụtara dị n'ime nyocha a. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49805234 +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ronaldo ọgbakeela? Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: A ka na-achọ ndị mụnyere isi ụlọọrụ ndị otu pati APC dị n'Imo steeti ọkụ ụnyaahụ. Hilary Eke bụ onye isioche APC n'Imo na-ekwu na ọ bụ ndị omekome busoro ndị otu ha agha n'izu gara aga, kpara mkpamkpa a. Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na nlọta ya otu ụbọchị tupu oge o kwuru na ọ ga-alọta abụghị maka ihe ọbụla, na ahụ siri ya ike. Cheta na Buhari kwesịburu ịlọta taa ka ọ gara UK ime nyocha maka ahụike ya. Amachiela onye bụbu Praịm minista ndị Malaysia bụ Najib Razak na nwunye ya ịpụ obodo ha. Ọ kwesịrị ịzara ọnụ ya maka ebubo eboro ya gbasara imefu nde dọla narị asaa oge ọ nọ n'ọchịchị n'afọ 2015. Onye egwu ndị Real Madrid bụ Cristiano Ronaldo alọghachịla ma bido ọzụzụ egwuregwu ọzọ. Cheta na Ronaldo rọjiri ụkwụ ka ha na ndị Barcelona zukọrọ n'ụbọchị ụka mere ka ụfọdụ na-atụ egwu ma ọ ga-agbake tupu ha na Liverpool ezukọọ na ngwụcha Champions League n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa a. Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a: https://www.bbc.com/igbo/afirika-44092360 +politics South East Governors Meeting: Lee etu ọgbakọ ndị ọchịchị mpaghara ala Igbo si aga n'Enugwu taa "N'agbanyeghị na ọ bụghị mbụ ha na-ekwu ya, otu jkọrọ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ekpebiela imalite otu nche 'Ebube Agu' na steeti ha dị iche iche na mpaghara ahụ. Ha kpebikwara na ụlọomeiwu nke steeti na mpaghara ahụ ga-etinye ya n'iwu tupu afọ 2021 agwụ. Dave Umahi bụ onyeisi otu jikọrọ gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ bụ onye kwuputara nke a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ka ha mechara ọgbakọ nchekwa n'Enugwu ụbọchị taa bụ Tuzde. Ndị gọvanọ bịara ọgbakọ ahụ gụnyere Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nke Enugwu steeti, Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo steeti, ebe Gọvanọ Willie Obianọ abịaghị (nke ọ na-ezite osote ya) ma Gọvanọ Okezie Ikpeazu zitere osote ya, Ude Oko-Chukwu. 2. ""Ndị gọvanọ na ndị ndu Ọwụwa Anyanwụ katọrọ oke gbuogbuogbuo na-eme na mpaghara ahụ ma kwekọrịtana ha na ndị ọrụ nchekwa ga-ejikọ aka kwụsị ya."" 3. ""Ọgbakọ ahụ katọrọ nọrọ- n-ụlọ nke ndị na-akpọkarị ya bụ ndị be anyị nọ ofesi bụ ndị amaghị ka o si emetụta n'ahụ. Ọgbakọ ahụ kpebiri ime ihe ọbụla dị n'iwu iji hụ na e nweghịkwa nọrọ-n-ụlọ ọzọ."" 4.""Ọgbakọ ahụ natara ozi mkpesa nke otu Ohaneze Ndigbo detara ha maka ọnọdụ nchekwa nakwa mmegbu ndị Igbo ma kwee nkwa ilebanye ya anya iji mara okwu ha ga-eji jekwuo Gọọmenti Etiti maka imeda obi ndị ntororịa."" 5. Ọgbakọ kpebiri inye ndị ọrụ chekwa nkwado iji nye aka weghachi udo n'Ọwụwa Anyanwụ."" 6. ""Ọgbakọ ahụ kpebiri ịkwado ntuliaka nAnambra steeti ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ịhụ na ọ gara n'udo n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba."" 7. ""Ọgbakọ ahụ kpokuru ndị ụkọchukwu na ndị ndu ụka , ndị eze ọdịnala ka ha ga n'ihu n'agwa ndị ntorobia okwu."" Lee etu ọgbakọ ndị ọchịchị mpaghara ala Igbo si gaa n'Enugwu Ọgbakọ pụrụ iche nke ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ hibere n'obi gọọmentị dị n'Enugwu taa bụ Tuzde amalitela. Ọ bụghị naanị ndị Gọvanọ ga-esonye n'ọgbakọ a, kama ndị ndu ndị ọzọ ga-esonyekwa na ya. Ndị a gụnyere: ndị isi ụka, ndị eze ọdịnala, ndị omeiwu nọ n'ụlọ omeiwu etiti, na ndị ọzọ. Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị ndu n'ala Igbo, nke gụnyere Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi, omeiwu Enyinnaya Abaribe, na omeiwu Ike Ekweremadu awuchiela na ya bụ ọgbakọ Ndị ọzọ gụnyere, Victor Umeh, Nnia Nwodo, omeiwu Tobi Okechukwu, Bishọp Godfrey Onah na ndị ọzọ. Gịnị ka a kpara n'ọgbakọ a? Ihe bụ isi a hụrụ kwaba okpu maka ọgbakọ a bụ ọnọdụ enweghị nchekwa na mpaghara dị icheiche n'ala Igbo. Lee foto etu ya bụ ọgbakọ si gaa:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-58799861 +politics Peter Obi ahọrọla Doyin Okupe dịka osote ya nke nchere oge Peter Obi ahọrọla Doyin Okupe dịka osote ya nke nchere oge. Otu Laboour Party wepụtara nke a n'akara soshal midia ha taa bụ Fraịde. Obi mere nke a iji mezuo iwu na-achịkọtọ ntuliaka 2023, dịka ngalaba 'Independent National Electoral Commission' (Inec) si wepụta. Inec kwuru na ọ bụ taa bụ abalị iri na asaa nke ọnwa Jun bụ ụbọchị ikpeazụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche nwere iji weta aha onye ga-azọ ọkwa onyeisiala nakwa osote ya. Ọ bụrụ na taa gafee, pati ọbụla na-ewetaghị aha ndị nke ha, ya bụ ntuliaka kwaala ha. Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ pati ndị ọzọ tinyekwara aha nchereoge dịka osote onyeisiala. Bola Tinubu nke 'All Progressives Congress' tinyekwara aha nchereoge dịka osote onyeisiala ya, mana ha ekwupụtabeghi onye ọ bụ. Mana ụlọntaakụkọ Arise TV na-ekwu na onye Tinubu tinyere aha ya bụ nwa amadi aha ya bụ Kabir Ibrahim Masari. Ngalaba 31 nke iwu na-achịkọta ntuliaka, a kpọrọ Electoral Act 2022', kwuru na naanị ụzọ abụọ ka e nwere ike iji gbanwee aha onye ahọpụtara maka ịzọ ọkwa ọchịchị. Nke mbụ bụ ma ọ bụrụ na onye ahụ ewere aka ya wepụ onwe ya n'ịzọ ya bụ ọkwa; nke abụọ bụ ma onye ahụ nwụọ. Ọ bụrụ na ihe dị otu a mee, pati ga-edegara Inec akwụkwọ ma wegara ha aha onye ha ga-eji dochie. A ga-emerịrị nke a ihe dịka ụbọchi iri itoolu (90 days) tupu ụbọchi ntuliaka. N'usoro ntuliaka nke afọ 2023, INEC kwuru na ndị pati dị icheiche nwere ohere ịgbanwe aha ndị ha tinyere ruo ụbọchị 15 nke ọnwa Julaị. Ọ gafee ụbọchị a, aha nke ha zigabuuru Inec bụ nke Inec ga-ewere. https://www.bbc.com/igbo/articles/cjk0n5dmkkdo +politics Trump Acquitted: Ihe mere ndị sineti mba Amerịka achụtụghịnwu Trump "Ndị sineti mba Amerịka emezughị ogo a ga-eji kpegbu aka chiburu Amerịka bụ Donald Trump maka ebubo ikpalite ndị mmadụ ka ha malite ọgbaghara mere na Capitol n'ụbọchị isii nke ọnwa January, 2021. Ha tụrụ vootu n'oge 57-43, nke bụ na ọ fọrọ naanị vote iri n'ime ọnụọgụ iri isii na asaa ekwesiri ịnweta ka ekpegbuo Trump mana orughị ogo ahụ. Dịka a hapụchara ya Trump depụtara ozi ebe o kwuru na ""ikpe a bụ ita ịgọ kachasị kamgbe ụwa gboo."" Nke a bụ ikpe nchutu abụ nke Trump ka sicha n'ọkwa onyeisiala rituo na mba Amerịka. Ọ bụrụ na ikpe mara Trump, ndị sineti kaarị ịkwụsị ya ịzọ ọkwa ọbụla n'Amerịka kpam kpam. Ka atụchara vootu, onyeisi ndị paati 'Republicans' n'ụlọ omeiwu bụ sinetọ Mitch McConnell kwuru na Trump bụ onye kpalitere mmụọ ndị mmadụ iji wakpoo Capitol ma kwuo na ọ bụ mgbahapụ ọrụ ya. Na mbụ o voturu ka aghara ima Trump ikpe makana iwu akwadoghị ya tụmadị ugbua Trump anọzị n'ọkwa onyeisala. Mana McConnell dọrọ aka na nti kwuo na Trump nwerike ịnata ebubo ọzọ n'ụlọikpe. Onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden kwuru na ọ bụrụgoi na ikpe amaghị Trump, ihe ndị mere ka ehibe ikpe ahụ abụghị ihe a na-agbagha agbagha. Ndị ụlọ omeiwu mba Amerịka ekwuola na ha nwereike ịbido atụmatụ ịchutu Donald Trump n'ọchịchị na-agbanyeghị na ọ pụọla dịka onyeisiala. N'aka nke ọzọ ka ndị ọkaiwu Trump na-ekwu na enweghị ike ikpe Trump ikpe n'ihi na ọ pụọla n'ọchịchị. Kama ndị ụlọomeiwu gara n'ihe mee ntụlịaka nke mpụtara ya bụ na mmadụ iri ise na isii kwetere ka ebido atụmatụ ịchụtu Trump ebe mmadụ iri ano na anọ ọzọ akwadoghị ya. A na-ebo Trump ebubo na ọ kwanyere ma kwado ndị wakporo ụlọ omeiwu Capitol nke mba Amerịka. Dịka ndị Ụlọomeiwu obele na mba Amerịka ebinyere aka n'akwụkwọ akpọrọ ""Articles of Impeachment"" na Bekee Onyeisiala Donald Trump si na onweghi ebe ya na-aga. Atụmatụ 'impeachment' a kwuru na Trump emetere ihe ekwesiri iji chụọ ha dịka onyeisiala mba Amerịka. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisiala Amerịka nke atọ ndị ụlọ omeiwu tinyere akwụkwọ ka achụpụ n'ọkwa. Mana, dịka o dere n'akara Twitter ya, Trump sị na ihe a ndị Ụlọomeiwu Nta mere ezighi ezi ma kwuo na ha ya ka kwụ chịm na-eche ikpe n'Ụlọomeiwu Ukwu. Ọ bụ Nancy Pelosi bụ Onyeisi Ụlọomeiwu nta gụpụtara atụmatụ ""Article of Impeachment"" a ọ sị bụ maka Trump iji ọkwa chọọ ọganyị ihu nke a etu ekwesighi ekweshi. Pelosi bụ onye kachasị nwee ọkwa n'ogige pati Democrat bụ ndị tinyere uchu n'atụmatụ a. Pelosi kwuru sị ""ọ bụ agwa na ezighị ezi onyeisiala kpara mere ka o dị mkpa na achụturu ya n'ọkwa"". Ka emechara ntuliaka eji maa Trump ikpe, Pelosi dere n'aka Twitter ya na onweghi onye gafere ikpe ikpe. Dịka ọ dị ugbua, Trump ka bụkwa onyeisiala Amerịka. Ọ bụ ndị ụloomeiwu ukwu ka ekpe zị ikpe ya ụgbụa. Kedu ihe ndi na-akwado Trump na-ekwu Patị Trump kwụ ya chịm n'azụ. Nke pụtara na enweghị olileanya na ha ga-ama ya ikpe na Sineti oge akwụkwọ 'impeachment' a rutere ebe ahụ. Ọtụtụ ndị Omeiwu patị Republikan tinyekwara ọnụ ma katọọ atụmatụ ịma Trump ikpe. Ihe na-ese okwu bụ ebubo na Onyeisiala Trump gwara onyeisiala mba Ukrane bụ Volodymyr Zelensky ka o nyochaa onye bụbụ osote onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden. Dịka Trump siri kwuo, Biden na nwa ya nwoke aha ya bụ Hunter Biden tinyere aka na nrụrụaka banyere ego mgbe nwa amadị ahu na-arụrụ otu ụlọọrụ na Ukarane ọrụ. Nke bụ eziokwu bụ na ndị Ukrane mere nyocha maka ebubo a ma sị na onweghi mpụ ha hụrụ. Nke bụ isi mmiri bụ na iwu Amerịka machiri onyeisiala mba ahụ ị sị ka mba ọzọ mere ya ihe ọma. Lee Usoro njem ichutu Donald Trump" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50835635 +entertainment Igbos in UK: Lekwa ka ndị Igbo bi na Liverpool si emepụta omenaala Igbo Igbo na-atụ ilu sị na 'onye aghaala nwanne'. Nke a bụ ihe ụmụafọ Igbo bi na Liverpool na-eme iji hụ na omenala Igbo ga-adị. Ọ bụkwa etu a ka ndị Igbo bi na Liverpool dị na mba Uk si nọkọrịta ụbọchị ha mere mmemme omenaala. Kirie ya ma gwa anyị ka obi dị gị n'elu soshal midia. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50450798 +health Workers' Day: Ndịọrụ ahụike na ndị ọzọ na-ekele ụmụ Naịjirịa n'ụbọchị ncheta ndịọrụ Ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee afọ ọbụla bụ ụbọchị ncheta ndịọrụ n'ụwa niile. Nke afọ a, ọrịa coronavirus emeela ka ọtụụ ndịọrụ nọrọ n'ụlọ. Naanị ndị ọrụ ahụike na ndị ọrụ ndị ọzọ dị mkpa na-agazi ọrụ n'oge a. Lee ka ụfọdụ ndịọrụ ahụike si ekele ụmụ Igbo taa. https://www.bbc.com/igbo/52504580 +entertainment Cubana Group: Ihe mere Obi Cubana ji gbachie otu ụlọ oriri ya dị n'Abuja "Otu ụlọoriri nke Cubana nwere n'Abuja akpọrọ 'Hustle & Bustle' agbachiela ụzọ ya. Dịka ha depụtara n'akara Instagram ha ọ bụ n'ihi ọnwụ otu onye bịara ebe ahụ ka nke a jiri mee. Ha kwuru sị ""ekpere anyị na-aga ebe ezinaụlọ nwaanyị ahụ nọ, ka mkpụrụ obi ya zuo ike n'udo"". Onye na-arụ n'ụlọoriri ọzọ Cubana nwere gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụ eziokwu na agbachiri ebe ahụ. Ọ sị ""ọ bụghị ebe m na-arụ ka agbchiri, mana ndị ọzọ gara ụnyaahụu(ụbọchị ụka) laghachite sị na akpọchiri ebe ahụ"". Ihe EFCC kwuru maka Obi Cubana Dịka foto nke EFCC na ụfọdụ ndị mmadụ a sịrị na ha bụ ndị ọrụ ụlọọrụ EFCC, ngalaba gọọmentị ahụ na-ebu agha megide mpụ metụtara ego na-efegharị na soshal midia,, ekwuola na akụkọ ahụ bụ akụkọ ụgha. N'ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahụ bụ Wilson Uwujaren binyere aka, ọ sịrị: ""Isiokwu foto ahụ bụ ụgha."" ""O nweghị mgbe Obi Cubana na ndị ọrụ EFCC sekọrọ foto dịka a na-eme ya nnyocha, oge e jichiri ya n'ọgige anyị maọbụ oge a tọhapụrụ ya."" Ụlọọrụ ahụ rụtụrụ aka na foto ahụ nke e sere n'abalị asaa nke ọnwa Oktoba afọ 2021 bụ na mmemme ibupụta akwụkwọ ọhụrụ nke Colonel Chukwu Obasi n'ọha nke e mere na ""Nigerian Army Resource Centre dị na Abuja, ebe Obi Cubana bụ onye ọbịa ka e sere ya. Obi Cubana enwerela onwe n'aka EFCC EFCC atọghapụla Obinna Iyiegbu e ji Obi Cubana mara bụ onye ha ji n'ogige ha kemgbe ụbọchị Monde. Obi gara ebe ahụ ịza oku nke ụlọorụ ahụ kpọrọ ya gbasara ebubo ibupu ego n'ụzọ ezighi ezi nakwa nrụrụaka ụtụ isi. Cheta na o nwere mgbe akụkọ wuru n'ụbọchị Tuusde na atọghapụrụ ya mgbe Obi depụtara ozi n'akara Instagram ya. Mana Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwujaren gwara BBC Igbo n'ekwentị n'ehihie Wenezde na Iyiegbu ka nọ n'aka kemgbe abalị atọ. Iyiegbu depụtara n'akara Instagram ya kwuo sị, ""Okpataozueora, a hụrụ m unu n'anya!"" nke mere ka ndị mmadụ chewe na a tọghapụla ya. Otu onye nọ Iyiegbu nso achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC Igbo nke a mana ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwajuren azaghi ekwentị ya ịkọwa nke na-eme. Nwunye ya bụ Ebele Iyiegbu depụtakwara n'akara Instagram nke ya sị "" a bụ m nwachinemelu!...onye chukwu goziri mmadụ apụghị ịbụ ya ọnụ"" O kwukwara ihe a ma na-eto di ya na ọ bụ odogwu, ọ bụ onye ndu, ọ bụ onye gbasiri ike na ihe ndị ọzọ. Gịnị bụ 'Money Laundering' bụ ebubo e boro Obi Cubana? Dịka iwu debere Naịjiria si nye, o nweghi ebe ọbụla nkọwa dị gbasara atụmatụ ahụ. Mana o nwere iwu amalitere iche iji lebanye anya ma kwụsị ya bụ ihe bụ Money Laundering Prohibition Act nke afọ 2011. Onye ọkaiwu bụ Barrister Chukwuemeka Eze kọwara ya bụ ihe dịka ikpata ego n'ụzọ ezighi ezi ma siri n'ụzọ ziri ezi mefuo ya. O kwuru na site etu e si kpata ego ahụ e nwere ngalaba dị icheiche ga-etinye anya mee nyocha banyere etu ego ahụ si bịa. Mana EFCC isi ụlọọrụ ọ dịrị ị mee nyocha gbasara ego ahụ maọbụrụ na ha chee na ego ahụ esighi ụzọ ziri ezi mapụta. EFCC atọghapụla Obi Iyiegbu a ma dịka Obi Cubana ha nwụchiri maka ebubo ibupu ego a kpara n'ụzọ ezighi ezi na mpụ metụtara ụtụisi. Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission bụ WIlson Uwujaren ekwuola na ha ka ji Obinna Iyiegbu e ji Obi Cubana mara. Uwujaren gwara BBC Igbo na ha nwụchịrị Obi Cubana ụnyahụ nakwa na ọ ka nọ n'aka ha ruo ugbua. O kweghị ekwu ihe mere ha ji nwuchie ha nakwa ebe ha nọ nwụchie ya. N'ọnụ ya, ""anyị nwụchiri nwamadi a, ma kwe ka o jiri ụkwụ ya bia ụlọọrụ anyị mana enweghị ihe ọzọ m chọrọ ikwu maka ya bụ okwu."" BBC Igbo jụrụ ya etu ha si nwụchie Obi Cubana, ọ sara si "" mgbe ọbụla ọ pụtara, ọ ga-eji ọnụ ya gwa ụnụ etu anyị si nwụchie ya. Anyị jụkwara ya ihe kpatara EFCC ji nwụchie Obi Cubana, ọ sara si "" onweghị ihe m ga-agwa ụwa ugbua gbasara nke ahụ karịa na anyị ka ji ya ruo ugbua."" Cubana Chief Priest bụ ezigbo ọyị Obi Cubana amanyela ọnụ n'akụkọ na-ewu ebe niile na ụlọọrụ EFCC nwụchiri ọyị ya nwoke ụnyahụ. O depụtara n'akara Instagram na ""ihe na-agaghị egbu anyị ga-eme ka anyị sịwanye ike, udiri ihe a amarala anyị bụ ndị Igbo ahụ. Mbakala ga-ama Ozo mana Ozo ga-ala. #Toghapụnụ Obi Cubana"" Ọ kpọghị okwu aha kpọmkwem mana etu o si tinye ""tọghapụ Obi Cubana"" gosiri na o nwere ihe mere n'ebe ya bụ nwa amadi ahụ nọ. Anyị ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ EFCC . Ihe na-ewu na soshal midia kamgbe mgbede ụnyaahụ bụ na ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) anwụchiela Obinna Iyiegbu e ji Obi Cubana mara. Akụkọ kwukwara na ụlọọrụ ahụ kpọrọ Obi Cubana ma na-agba ya ajụjụ ọnụ n'ụlọọrụ ha dị n'Abuja. Mana mgbe BBC Igbo zigara Obi Cubana ozi ka ha mata nke bụ eziokwu, ọ zabeghị ozi ahụ rukwa ugbua. EFCC apụtabeghị kpọmkwem kwuo ma ha anwụchịrị nwamadi a maọbụ na ha anwụchighi ya. Obi Cubana dị afọ iri anọ na isii bụ onye Anambra dị na mpaghara ọwụwa Anyanwụ na-eme ahịa oriri na nkwari. O bidoro wuwe n'ọnwa Julaị 2021 mgbe ọ kwara nne ya nwụrụlanụ na be ha bụ Oba dị n'okpuruọchịchị Idemili Saụt nakwa etu e si mefuo ego n'akwamozu ahụ. Ndị mmadụ malitere katọwa etu o si na-efesasi ego n'emume ahụ mana na mkparịtaụka Cubana nyere BBC Igbo o kwuru na ọ bụ ya na ndị ọyị ya kpatara ego nke mere na ha ga-erinwu ya etu ọ bụla o si sọ ha. Akụkọ ka na-abia." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59108835 +politics Abia state politics: Ihe mere m ji wụpụ n'APGA nakwa pati m ga-abanye - Alex Otti Alex Otti zọbụrụ ọkwa gọvanọ n'Abia steeti gwara BBC Igbo ihe mere o ji si na pati All Progressives Grand Alliance (APGA) ọ nọbụ na ya pụọ. O kwuru na mgbe oge ruru na ọ ga-agwa ụwa niile patị ọzọ ọ na-aga. Gere ya n'uju n'ihe nkiri a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-53042311 +entertainment N30 million bounty: Ndị agha anwụchiela Bobrisky "Akụkọ dị mkpa: Aka ndị agha NAijria akarala Bobrisky na Rịvas steeti. Nke a na-eme na erụghị otu abalị Gọvanọ Nyesom Wike bụ aka na-achị Rivas steeti nyechara ntụziaka inye onye ọbụla gbara ama etu aga esi nweta Bobrisky nde naira 30. Ọ bụ Wike gbara ama na a nwụchiri Bobrisky na nzụkọ ya na ndị ndu obodo Rumuolumeni na obi gọọmentị na Pọtakọt. Bobrisky Gokana bụ otu onye otu nzuzo na-akpa ike nke a na-eno na aka ya dị n'ogbugbu otu onye ọrụ gọọmenti welitere isi na obodo Choba dị na steeti ahụ. N'otu aka ahụ, Idris Okuneye nke a ma ama dịka Bobrisky ekwuola n'akara Ịnstagram ya na ọ bụghị ya bụ onye omekome gọvanọ Rịvas na-achọ ka a nwụchie. "" Ekele dịrị Chukwu na abụzị m nwaanyị."" Ahụrụ achụsala ndị omeiwu Ndọrịtaụka maka ịhe gbasara ọdọ ahịa bụ ihe gbosara n'ike n'ụlọomeiwu mba Kenya dịka isi ahụrụ kpọrụrụ na nsonso. Otu onye omeiwu bụ Julius Gaya sịrị, ""Onyeisi ụlọomeiwu, otu onye n'ime anyị anyụọla ahụrụ isi gbarụọ ikuku. Ama m onye mere ya."" Mana onye ọ tụrụ aka gọrọ isi onwe ya sị, "" Ọ bụghịkwa m. Agaghị emeli ụdị ihe n'ebe ndị ogbo m nọ."" Onyeisi ụlọomeiwu bụ Edwin Kakach nyere ntụzịaka ha agbasa ọgbakọ ha nwoke ka ihe na-esi kwụsịlata may nye iwu ka agba ikuku isi ọma n'ụlọomeiwu ahụ. Kwụọ nde naịra Ụlọikpe dị na Legọs enyeela onye bụbu onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Maurice iwu ikike iji ego dị otu ijeri naịra na ndị akaebe abụọ gbapụta onwe ya. Ụlọọrụ EFCC kpụpụrụ Iwu n'ụlọikpe n'ụbọchị Tọzde n'ihi nrụrụaka ego dị otu ijeri naịra na ọma abụọ. N'akụkọ yiri ibe ya; Ụlọọrụ EFCC ekwuola na ha adịla njikere ịkpụpụ ọkaiwu Atiku Abubakar na nwanne ya nwoke n'ụlọikpe mpupu ego dị nde dọla abụọ. Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ a bụ Tony Orilade gwara BBC Igbo na ndị a ga-awụchi n'ụlọikpe na-egbughi bịa zara ọnụ. Onyeisiala Buahri alala Daura Onyeisiala Buhari alala n'obodo ya bụ Daura, Katsina Steeti maka emume Salah ga-amalite ụbọchị ụka ebe nwunye ya bụ Aisha gawara Mina, Saudi Arabia ime nke ya. Buhari na-anọ n'obodo ya rue abalị iri na asatọ nke ọnwa Ọgọstụ. N'ofesi Akụnaụba mba UK adaala mba nke mbụ ya kamgbe afọ 2012 dịka ụlọọrụ ngụkọ a kpọrọ National Statistics si kwuo. Gọvanọ Enugu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi enyela iwu ka ndị eze ọdinala niile na ebighị na obodo ha n'Enugwu steeti were ọsọ laghachị azụ ga biri na obodo ha. Gọvanọ Ugwuanyi kwuru nke a dịka ya na ndị eze nwere nzụko n'ụbochị Tụzde. Ugwuanyị kwuru na nchekwa ndụ na akụnụba ndị Enugwu steeti kacha mkpa nke mere na ndị eze ọdịnala kwesịri ibi n'obodo ha na-achi ka ha nyere aka na nchekwa obodo ha. Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia Steeti ekwuola na anwụchịela onye agha gbagburu nwaokoroọbia n'Aba. Obị adighị Ikpeazu nma dịka o kwuru na ndị nchekwa a na akwu ugwọ maka nchekwa ndi obodo bụzi ndi na-egbu ndi obodo ha na-echekwa. Ikpeazu kwuru nke a mgbe ọ gara mgbaru na be nwaamadị a nwụrụ sị na ndị Abia steeti anabataghị ụdiri agwa ọjuọ a ma kwee nkwa na ezinaụlọ ya agaghị ata ahụhụ. Otu ndọrọndorọ ochịchị agbaala osote Gọvanọ bụ Simon Achuba arụkwaghịm. Ha kwụrụ na ha chụpụru ya nihi na okpara agwa megidere ọdịnma APC mgbe a na eme ntuliaka 2019. Ngalaba na-ahụ maka nnabata ndị mmadụ n'ọbodo Amerịka ekwuola na ha ahapula mmadụ nari atọ n'ime ihe ruru ndị mmadụ Nari isii na iri asatọ ha nwuchiri n'obodo Missisipi . Nwụchịkọ ndị a sọ na atụmatụ Onyeisiala Donald Trump weputara n'onwa Jụn maka ịnwụchị ndị na-ejighi akwukwo ziri ezi bata Amerika. Obi adighi ndị na akwado otu egwu bọolụ Arsenal mma dịka ha resiri Everton Alex Iwobi n'ọnụ ego ga eru Pounds iri atọ na anọ. Cheta na Iwobi bidoro gbawa Arsena bọolụ n'afọ 2015 ma ugbua, ọ ga a nonyere Theo walcot sikwa Arsenal gaa Everton. Gee nkeji BBC ebe:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49290190 +entertainment Tony Ubesie: Akatamkpo nwoke gbara mbọ maka nkwalite asụsụ Igbo "Ọ bụrụ na Tony Uchenna Ubesie ka nọ ndụ, taa ka ọ gaara agba afọ iri asaa na abụọ. Ma na-agbanyeghị na ya bụ nwa amadị e ji eje mba alaala mmụọ, ama ka na-agbakwa maka ike ọ kpara iji wulite asụsụ Igbo . Onweghị nwa afọ Igbo ọbụla mụrụ asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị na-agụghị ọbụladị otu n'ime akwụkwọ Ubesie dere. Ubesie abụghị onye mbụ ji Igbo dee akwụkwọ akụkọ, mana aha ya kacha ada ụda ma a gụwa ndị odeakwụkwọ Igbo. Ubesie bụ onye obodo Achị nke dị n'okpuru ọchịchị Oji Riva nke Enugwu steeti. A mụrụ Ubesie n'ụbọchị 22 nke ọnwa Febrụwarị afọ 1950 n'Enugwu. Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa dị na Nsụkka ebe ọ mụrụ maka asụsụ bụ nke Bekee kpọrọ 'Linguistics'. Akụkọ kwuru na Ubesie so na ndị agha Biafra oge a lụrụ agha. Ka agha Bịafra bichara n'afọ 1970, Ubesie malitere ide akwụkwọ akụkọ iji kọwaa ihe dị icheiche ndị mmadụ gabigara n'oge agha. Ọtụtụ akwụkwọ o dere gbadoro ụkwụ n'agha Biafra. Ubesie so na-agbụrụ nke abụọ ndị ji asụsụ Igbo dee akwụkwọ. Agbụrụ nke mbụ bụ ndị dere akwụkwọ nke ha tupu alụọ agha. Ha gụnyere Pita Nwanna (onye dere Omenụkọ), D.N Achara (onye dere Ala Bingo), Leopold Bell-Gam (dere Ije Odumodu Jere), na ndị ọzọ Ọ bụ eziokwu na ihe e ji mara Ubesie bụ akwụkwọ akụkọ isii o dere, mana ọ bụghị naanị ha bụ akwụkwọ o dere. Ubesie dere abụ itoolu n'ime akwụkwọ abụ a kpọrọ 'Akpa Uche'. O nwekwara otu akwụkwọ ejije. Akwụkwọ akụkọ ya gụnyere: Ubesie bụkwa onye ntaakụkọ, onye nhazi ejije nke Bekee kpọrọ ""theatre director"" nakwa onye nkwalite ọdịnala. Dịka e si depụta n'ọba ozi wikidata.org, Tony Ubesie nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ na Mmakụ dị n'Enugwu. Ihe mberede a mere n'ụbọchị 11 nke ọnwa Febrụwarị afọ 1994. Mana ndị Igbo na-atụ ilu sị, ""Dimkpa taa akụ, a hụ ichere ya"". Ubesie gbalịrị ike ya ịkwalite asụsụ Igbo oge ọ dị ndụ, ye mere ude ya ka ji ede na-agbanyeghi na o meela afọ 26 ọ larala mmụọ. Ogbonnaya Mark bụ nwaokorobịa na-ede akwụkwọ Igbo kwuru na ọ bụ Ubesie kpalitere ya o ji malite inwe mmasị ịkwalite asụsụ Igbo. Prince Ik Okolo gbakwara ama na Ubesie bụ dike e ji aga mba n'ịkwalite asụsụ Igbo. @OnyeAjụjụ na @ikifediata kwuru na onye chọrọ ịmụta asụsụ Igbo, ya gụọ akwụkwọ Ubesie." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51580085 +entertainment Mark Angel Comedy: 'Ime ihe ọchị anaghị egbochi Emmanuella ịgụ akwụkwọ' Nwatakịrị nwaanyị aha ya bụ Emmanuella eritela nturuugo dị icheiche maka ime ihe ọchị. Ihe nkiri ya karịrị akarị n'ọba ihe nkiri 'Youtube' nke mere ka ndị mmadụ na-ajụ ma ọ na-enwezịkwa ohere ịgụ akwụkwọ. Mana onye nlekọta ya bụ Mark Angel gwara BBC Igbo na ime ihe ọchị anakwaghị egbochi ya ịgụ akwụkwọ. Mark Angel kọwakwara ebumnuche ya gbasara Emmanuella na Success n'ọdịnihu. Kirie mkparịtaụka ha na BBC Igbo nwere. Onye mepụtara ihe nkiri a bụ Nnamdị Agbanelo. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51536488 +politics Akụkọ kachasị n'abalị a: Ogbuagu sị sonye na ntuliaka Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Dike Igbo ama ama na-ịkpa ụka ọchị bụ Uche Ogbuagu arịọla ụmụ ntotobịa Igbo ka ha ga gbata akwụkwọ ikike eji eme ntuliaka ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọgbuagụ rịorịọ arịrịọ a mgbe ya na BBC nwere mkparịta ụka ụnyahụ n'obị ya n'Ikeduru, Imo Steeti bụ ebe ọnọrọ riọ ụmụ ntọrọbịa ka ha ghara iji akpịrị ego refuo ikike ha nwere iji weta mgbanwe tọrọatọ n'ndụ ha. Ode akwụkwọ otu jikọtara ndị otu kristi na Naịjirịa akpọrọ CAN n'aha ịchafụ bụ Rev. Musa Asake alala mmụọ ka ọrịachara ọbere ọrịa. Onyeisi mgbasa ọzị ndị otu a bụ Pastọ Adebayo Oladeji gwara ndị nta akụkọ nke a mgbe ya na ha nwere mkparịta ụka. Iran akwadola mba Syria ka Izrelu tụchara ha ogbunigwe Mba Iran akwadola ndị Syrịa dika mba nwere ikike ịkwuru onwe. Iran kwuru nke a ka Izrelu tụchara ogbunigwe na ihe ha hutara dika ka ọdọ ndị agha ndị Iran dị na Syria ma katọkwa ụma Izrelu mere. N'egwuregwu UEFA eriela Gianluigi Buffon iwu N'egwuruegwu, otu UEFA amala Gianluigi Buffon nke Juventus Ikpe ka ọkparịchara onye ogbu opi na asọmpị ha na Real madrid. Nke a mere ka ogbu opi ahụ nyechere ndị Real Madrid penariti dịka ọfọrọ tinkọm tinkọm ole ka egwu bọlụ ahụ bie. Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Ị mara ihe ọfọ bụ n'ala Igbo? https://www.bbc.com/igbo/afirika-44088606 +entertainment Onye bụ 'Mrs Churchhill' mere ka ụwa kpụrụ Tonto Dikeh n'ọnụ ugbua? "Ụmụ Naịjirịa nọ n'elu twitter na-aja Tonto Dike ike ka Churchill bụbụ di ya depụtachara ozi ebe ọ kpọrọ nwaanyị ọzọ ""Mrs Churchhill."" Olakunle Churchill degara onye na-eme ihe nkiri a na-akpọ Rosy Meurer ekele maka ụbọchụ ncheta ọmụmụ ya ma tinye 'Mrs Churchhill' na ngwụcha ekele ahụ. Nke a mere ka ụmụ Naịjirịa kwuwe na ha chetara mgbe Tonto Dikeh kwuru na Meurer na-etinye anya n'ebe di ya Churchhill nọ mgbe ha na-alụ di na nwunye. Ụfọdụ kwuru na ozi a egosila na ya bụ Churchhill na Meurer na-ayịbu dịka Tonto si boo ha na mbụ. Lee ụfọdụ okwu ha depụtara. Cheta na Tonto na Olakunle lụrụ di na nwunye n'afọ 2016 ma gbaa alụkwaghịm n'afọ 2017. Ọtụtụ ndị a ma ama na-eme ihe nkiri ekwuputela uche ha gbasara ihe Tonto Dikeh kọwara ndị ntaakụkọ maka di ọlụbụrụ. Churchill bụ di ọlụbụrụ kwuru na ọ bụ amara na-eche ya ma nwekwa obi ekele. Nke ndị mmadụ sonyere n'ụtụtụ a bụ ọzọ na-akpọtụ n'etiti Tonto na Ik Ogbonna bụkwa onye na-eme ihe nkiri Ik Ogbonna gwara ya n'elu instagram na tupu o mee ihe ọ bụla n'elu soshal midia ya cheta nwa ya nwoke. Lee ihe Tonto sara ya: @renoomokri kwuru na ọdịghị mma ka mmadụ na-ekwucha ihe ọjọ niile ọ ma maka di ọlụbụrụ maọbụ onye ọyịbụrụ. Funke Adesiyan sokwa na ndị manyere ọnụ n'okwu a mana ndị mmadụ pụtara katọọ ya. A mabeghị mgbe okwu a ga-ebi mana anyị ka nọ ma na-ewetere ụnụ ka o si gaa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-48135421 +politics Uganda Elections 2021 Results: Wine ajụla mpụtara ntuliaka mba Uganda "Otu onye so na-azọ ọkwa onyeisiala mba Uganda bụ Bobi Wine ajụla mpụtara ntuliaka agụpụtarala ma kpọọ onwe ya onyeisiala a họpụtara. Bobi Wine ezi aha ya bụ Robert Kyagulanyi sị nke a bụ nrụrụaka kachasị e merela na mba ahụ. O kwuru sị na nke a ka bụ mmalite ndọrọ ndọrọ. Ọ sị na ọ ga-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'oge na-adịghị anya. Mana ndị na-ahazi ntuliaka na mba ahụ bụ Ugandan Electoral Commission sị na a gụchabeghi vootu niile na ntuliaka ahụ. N'aka nke ọzọ ndịagha agbaala ụlọ Bobi Wine okirikiri ugbua. Yoweri Museveni ka na-emeri ugbua na mpụtara ntuliaka Uganda Onyeisiala mba Yuganda bụ Yoweri Museveni na-emeri dịka o si kwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị Fraịde na mpụtara ntuliaka mba ha. O nwere vootu dị 1,536,205 vootu (65.02%), ebe onye kachasị ama ya aka bụ Robert Kyagulanyi e ji Bobi Wine mara nwe vootu has 647,146 vootu (27.39%) n'ọgbọ ịtụ vootu dị 8,310. E nwere ọgbọ ịtụ vootu dị 34,684 na Uganda gbaa gburugburu. Bobi Wine boro ebubo na e nwere ọtụtụt nrụrụaka n'ebe dị iche iche a tụrụ vootu mana ọ kọwaghị n'uju banyere ebubo a. Mana gọọmentị Uganda sị na ntuliaka ndị a gara n'udo. Ntuliaka Uganda gara nke ọma - Uganda Electoral Commission Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na mba Uganda bụ Uganda Electoral Commission sị na ntuliaka ha gara nke ọma dịka a na-eche mpụtara ya. Onyeisioche ha bụ Simon Mugenyi Byabakama etoola etu ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na ndịome iwu si gbaa mbọ n'ịzọ ọkwa ndị a. O kwuru nke na mgbasaozi o nyere n'isi obodo mba ahụ bụ Kampala na ndị Uganda pụtara n'igwe ma tụọ vootu na-agbanyehi ọrịa coronavirus na-arị elu. Ọ gara n'ihu sị na a ga-akpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ n'ime awa 48 e mechara ya mana ndị mmadụ na-ajụ ""Kedụ ka ha ga-eji gụkọọ ya?"" maka na gọọmentị machiri ịntanetị kamgbe ụbọchị abụọ. Onyeisiala mba Uganda atụọla vootu nke ya Yoweri Museveni bụ onyeisiala mba Yuganda atụọla vootu ya ka ọ fọrọ nkeji iri na ise ka e mechie ịtụ vootu. Nwamadị a na-anọọla n'ọchịchị kamgbe afọ 1986 na-azọ ọkwa ọchịchị nke ugboro isii. Bobi Wine na nwunye ya Barbara atụọla vootu Bobi Wine na-azọ ọkwa onyeisiala mba Yuganda na nwunye ya bụ Barbara atụọla vootu nke ha. Dịka o mechara nke a ọ gwara ndị nkwado ya ""Nọọrọ nụ n'ọgbọ ịtụ vootu, ha kpachiri ịntanetị iji mee nrụrụaka na ntuliaka"" Bobi Wine gwara BBC mgbe ọ tụchara vootu ""Museveni machiri ịntanet iji mee nrụrụaka na ntuliaka."" Bobi Wine onye ezigbo aha ya bụ Robert Kyagulanyị bụ onye eti egwu a ma ama mechara banye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Wine na nwunye tụrụ vootu ha n'ihe dịka elekere itoolu nke ụtụtụ ụbọchị Tọsde. A ga-emechi ntuliaka a n'elekere abụọ nke ehihie adịka a ga-akpọpụta mpụtara ya n'ụbọchị abụọ e mechara ya. Ụmụafọ mba Yuganda apụtala n'igwe n'ụzọ ụtụtụ ụbọchị Tọsde 14 Jenụwarị afọ 2020, iji họpụta onyeisiala ọhụrụ ha. Ndị gbapụtara ihe n'ime mmadụ iri na-azọ ọkwa a bụ Yoweri Museveni onyeisiala ha ji ọkwa a kamgbe 1986 na Bobi Wine bụ onye omeiwu a ma ama na-etikwa egwu. N'ụbọchị abụọ gara aga ka gọọmentị machiri soshal midia na mba ahụ n'ihi ntuliaka a, mana ọtụtụ ụmụafọ ha akatọọla ụdị agwa gọọmentị kpara. Ndị nlere anya si mba ọzọ katọkwara usoro ntuliaka ahụ maka nwuchi ụfọdụ ndị na-azọsị onyeisiala Museveni ọkwa onyeisiala. Bobi Wine ọ ga-emeri Museveni Yoweri n'ọkwa onyeisiala Uganda? Enwetubeghị mgbe enyefere ọchịchị onyeisiala n'aka onye ọzọ na Uganda mana otiegwu bụzi onye ndọrọndọrọ ọchịchị akpọrọ Bobi Wine na-achọ igbanwe nke a site n'ịdọpụ oche onyeisiala n'ike Yoweri Museveni na ntuliaka a ga-eme na mba ahụ echi bụ Jenụwarị 13,2021. Bobi Wine dị afọ iri atọ na asatọ , ezigbo aha ya bụ Robert Kyagulanyi ekwuola na agbanyeghị etu ndị ọrụ nchekwa ji achọ ka ha wepụ ndụ ya n'achụmta vootu o na-eme, ọ gaghị ada mba n'ịzọta ọkwa onyeisiala na ntụliaka echi. Wine ejikwa 'Ghetto President' wee mara gwara BBC na ndị mmadụ anaghị eso ya na nkịtị kama ha na-eso ihe o kwetere na ya makana na ha chọrọ ndụ ka mma. Njirimara ihe patị ya bụ National Unity Platform (NUP) ga-eme ma ha bata ọchịchị bụ ikwalite ahụike, agụmaakwụkwọ, ezigbo mmiri na ikpe kwụọtọ. NUP kwetere na ihe ndị a niile ga-abịa na mmezu maọbụrụ na ha kwapụ onyeisiala Museveni n'oche. Kamgbe afọ iri abụọ ka Bobi Wine malitere iti egwu na-ekwu maka atụmaatrụ ndị pati ya kpọpụtara nke mere ka ọtụtụ mmadụ kwenye ma na-eso ya. Ntụliaka echi ga-agba ama ma ha a ga-azọta ọkwa ahụ. Ndị mmadụ nọ n'elu soshal midia na-akatọ etu onyeisiala Yoweri Museveni nke Uganda si mechie ọbaozi soshal midia dịka a na-akwado ime ntuliaka echi bụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Jenụwarị. Gọọmenti Uganda na-ebo Facebook ebubo na ha mechiri ọbaozi facebook nke gọọmenti ha makana Facebook chere na ha na-ezipu ozi ga-emetụta ntuliaka na-abịanụ n'ụzọ na-adị mma. Mana ndị dịka Twitter, UN nakwa mba US apụtala katọọ ya bụ atụmmatụ ma na-ekwu na o mejọrọ iwu ikike diri onye. Nke a bụ otu n'ime ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere ụwa ji kpụrụ Museveni n'ọnụ ugbua. Museveni ka na-azọ ọkwa ọchịchị na ntuliaka a a ga-eme echị bụ Jenụwarị 14, 2021. A na-eche na Bobi Wine bụ onye ntoroọbịa na-azọkwa ọkwa onyeisiala bụ otu onye na-echu Museveni ụra maka etu o si jiri ọbaozi soshal midia na-achụ nta vootu ya. N'ime mkparịtaụka, Museveni na ụlọ ọrụ mgbasa ozi CNN nwere nso nso a, o kwuru na o nwere olileanya na ndị ntoroọbịa Uganda ka ga-atụnyere ya vootu nke ụgboro isii a makana ọ zọrọ ndụ ha mgbe ha ka bụ ụmụaka. Akụkọ ka na-abịa" https://www.bbc.com/igbo/afirika-55608348 +religion Lee aha ndị a na-eche mere mwakpo ụlọụka Katọlịk St Francis, Owo "Ndị agha Naịjirịa akpọpụtala aha ma gbaa n’anwụ ndị a na-eche mere mwakpo ụlọụka Katọlịk St. Francis nke Owo, Ondo steeti. N’akwụkwọ ozi ha nke otu ọnụ na-ekwuru ha bụ Jimmy Akpor binyere aka, ọ depụtara na aha ndị a bụ Idris Abdulmalik Omeiza (nke e ji Bin Malik mere), Momoh Otohu Abubakar, Aliyu Yusuf Itopa na Auwal Ishaq Onimisi. Akpor kwuru na ọ bụ atụmatụ ndị ọrụ nchekwa jịkọrọ aka ọnụ mee bụ ihe mitara mkpụrụ a. Gọvanọ na-achị Ondo Steeti bụ Arakunrin Oluwarotimi Akeredolu sị na ọ bụ eziokwu na a nwuchiela ndị gburu ọchụ n'ụlọuka St. Francis Katọlik dị n'Owo. O kwuru nke a nwa obere oge onyeisi ndị nchekwa na Naịjirịa bụ Lucky Irabor kwupụtachara nke a n'Abuja. Gọvanọ sị na onye nwe ụlọ ebe ndị ahụ nọ tupu ha emee mwakpo a sokwa na ndị a nwuchiri. Ọ sị na gọọmenti egbughi oge ọbụla isi imi n'ala iji chọpụta ndị oyi ndụ egwu kamgbe ha kpachara arụ a n'ụbọchị 5 Juun 2022. Onyeisi ọrụ nchekwa na Naịjirịa bụ Leo Irabor kwupụtara nke a n’ụbọchị Tuzde mgbe ya na ndị ụlọọrụ ntaakụkọ na-akpata nkata. Ọ sị na a nwuchiri ndị a site na njikọ aka ndịagha, ndị DSS nakwa ndị uweojii. Irabor sị na a ga-agba ndị a n'anwụ ma ọ bụrụ na e mechaa nyocha ha na-eme banyere ya. N'okwu ya ""Anyị anwụchiela ndị kpara arụ ọjọọ a n'Owo. ""Ọ bụ ebumnobi m igosi ndị a n'ihu ọha mana n'ihi na nyocha ka na-aga n'ihu, a gbanwere obi m."" N'ụbọchị 5 nke ọnwa Juun afọ 2022, njinji jiri n'Owo Ondo Steeti mgbe ndị ojiegbe wakporo ụlọụka Francis Katọlik ebe ndị na-aka ụka dịka Fada Andrew Abayomi si kwuo. Ndị a malitere ịgba egbe nakwa ịtụ ogbunigwe aghara aghara nke butere ọnwụ mmadụ ruru iri anọ. Gọvanọ Akeredolu nyere ụbọchị asaa dịka ụbọchị akwa na ọnụma maka ndị egburu egbu. Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari katọrọ mwakpo ma sị na ọ bụ aka ọrụ ndị obi tara mmiri. N'otu aka ahụ onyeisi ụka Katọlik n'ụwa bụ Pope Francis kpeere ndị a ekpere ma sị ka mkpụrụ obi ha laa na ndokwa. Site mgbe ahụ rute ugbua ndị ọrụ nchekwa na-agba mbọ na-achọ ndị kpara arụ a n'ike. Gọọmentị Naịjirịa sị na ọ bụ ndị oyi ndụ egwu a kpọrọ Islamic State West Africa Province carry out di deadly attack (ISWAP) kpara arụ a. Minista na-ahụ maka ihe na-eme n'ime obodo bụ Rauf Aregbesola gbara ama a mgbe ha na Onyeisiala Buhari mechara nzukọ banyere nchekwa." https://www.bbc.com/igbo/articles/cp0qz734nglo +business Ndị atụmatụ Self certification form metụtara - FIRS "Gọọmentị Naịjirịa ehiwela atụmatụ ọhụrụ a ga-eji na-anata ndị mmadụ njirimara a kpọrọ ""Self Certification form"" . Gọọmentị sị ha ga-anata ndị emeghị iha ego dị n'ụlọakụ ha. Dịka gọọmentị Naịjirịa kwupụtara ihe a n'ụbọchị Tọọzde, ọtụtụ mmadụ gbarụrụ ihu banyere ya, gụnyere na Naịjirịa nwere ọtụtụ usoro e ji anata ndị mmadụ njirimara. Atụmatụ ndị a gụnyere ""Bank Verification Number"", ""Tax Identification Number"", ""National Identification Number"" nakwa ndị ọzọ. Dịka ngalaba na-anata ụtụisi bụ nke Bekee kpọrọ Federal Inland Revenue Service (FIRS) siri kọwa, na ọ bụ ndị a kpọrọ ""Reportable Persons"" nwere ego n'ụlọakụ ha kpọrọ Reportable Financial Institutions"". Na nkọwa okwu ụtụisi, onye a kpọrọ ""Reportable Person"" bụ ndị si n'ofesi bi na mba ebe ha kwesịrị ịkwụ ụtụisi. Nke pụtara na mmadụ niile bi Naịjirịa, n'agbanyeghị mba ha si, kwesịrị ịkwụ Naịjirịa ụtụisi. Dịka ngalaba FIRS siri kọwaa, ọ bụ ndị abụghị ndị Naịjirịa na ụlọọrụ abụghị nke Naịjirịa ka iwu a kachasị metụta. Nkọwa a FIRS wetere na-abịa ka ndị mmadụ gbarụchara ihu banyere atụmatụ ị sị ha gaa debanye aha n'akwụkwọ ọzọ. Ọ pụtara ihe na g��ọmentị meghere n'ozi mbụ ha gbasara nke mere ka ha riọ mgbaghara." https://www.bbc.com/igbo/afirika-54204486 +business Royal Rebranding: Gịnị ga-eme ego, 'stamp' nakwa akwụkọ njem mba Britain? "Dịka ọ chịchara afọ iri asaa n'ọkwa, Ezenwaanyị Elizabeth abụrụla onye dị mkpa na ndụ ndị mba Briten. A na-ahụ isi ya n'ego, nakwa ngwa ndị ọzọ mana gịnị ga-eme ugbua? Ego igwe niile dị na mba Briten ruru ijeri iri abụo na itoolu nwere isi Ezenwaanyị n'elu ya. Nke ọhụrụ a kachasị mee bụ nke ewepụtara n'afọ 2015 mgbe ọ dị afọ iri asatọ na asatọ. Nke ahụ bụ mgbanwe nke ise emerela kemgbe ọ nọ n'ọkwa. Ụlọọrụ na-arụpụta ego ahụ bụ 'Royal Mint' ekwubeghi mgbe ha ga-eji bido rụpụtawa ego igwe bu isi Eze Charles III na ya mana o nwereike iwe ọtụtụ afọ n'ihi na usoro mgbanwe ya ga-abụ nwayọ nwayọ. Tupu agbanwee ego igwe niile site na Teknuzu n'afọ 1971, a na-ahụkarị ndị Eze dị icheiche n'ego mba Briten. Amabeghi etu ego igwe bu ihu Eze ọhụrụ ga-adị mana otu ego igwe emepụtara iche maka ncheta ọmụmụ ya mgbe ọ gbara afọ iri asaa tupenyere azụ. Gọọmentị binye ya aka, a ga-abipute usoro ego ọhụru n'ụlọorụ Royal Mint nke dị na Llantrisant na Saụt Wales. Ihu Ezenwaanyị bụ ihe dị n'ego si ụlọakụ mba Ingland kemgbe afọ 1960. Ha ruru ijeri anọ na ụma ise ma ruo ijeri paụnds iri asatọ dị ka ọ dị ugbua nke mere na dịka ego igwe, a ga-eji nwayọ gbanwe ya. Ego akwụkwọ na ego igwe niile ka kwụ chị m. Ụlọakụ mba Ingland ga-enye ọtụtụ mgbasaozi nakwa oge maọbụrụ na ọ ga-agbanwe. Kemgbe afọ 1967, Stamp niile ebiputara na-ebu isi Ezenwaanyị Elizabeth II e si n'akụkụ sere. Ụlọorụ Royal Mail ga-akwụsị ibiputa ndi bu isi Ezenwaanyị Elizabeth II ma bido usoro ibipụta ndị ọhụrụ - mana a ka nwereike ị na-eji ndị ochie ezipu ozi edemede. E tinyebuola ihe Eze ọhụrụ na Stamp mana Royal Mail amabeghi etu eserese ndị ọhụru ga-esi dị. Ihe karịrị pasentị iri isii n'igbe ozi edemede niile bụ ntụpọ EIIR bụ nke Ezenwaanyị Elizabth nke pụtara E - Elizabeth, R - Regina (pụtara Ezenwaanyị). Na mpụta Scotland, igbe ọhụrụ ọbụla ịhụrụ ga-ebu apa Eze ọhụrụ mana ọnụogụgụ ndị ha na-ewepụta pere mpe nke ga-eme ka o tee aka tupu ịhụ nke bu ya. Site na ngwa nri bụ Ketchup rue na nri ọka na anwụrụ isi ọma, ị nwereike ịhụ njirimara Ezenwaanyị ebe e dere ""By appointment to Her Majesty the Queen"" n'ahụ ngwa ndị ịzụrụ na be gi. Ngwa ndị ahụ bụ ndị enyere 'nnabata' maọbụ 'Warrant' nke pụtara na ụlọọrụ ahụ na-ebugakwara ya ezinaụlọ Ezenwaanyị kwa mgbe kwamgbe. Kemgbe afọ otu narị gara aga, onye na-achị, nwunye maọbụ di ha nakwa onye ga-anọchi ha anya na-ewepụta njirimara 'warrant' nke ha nke pụtara na ụlọọrụ 800 nweruru warrant ruru 900 ha ji. Onye na-enye warrant ahụ nwụọ, ụlọọrụ ndị ji ya nwere afọ abụọ iwepụ njirimara onye ahụ na ngwa ha. 'Warrant' ndị Charles nyere dịka Ọkparaeze ka ga-adị ugbua ọ buzi eze maka na o so ya n'abụghị echichi ya. A na-atụ anya na Eze ọhụrụ ga-enye nwa ya bụ Ọkparaeze William ikike iwepụta 'Warrant' nke ya. Mana ọ bụghị sọsọ ego na 'Stamp' ka a ga-eme mgbanwe. Akwụkwo njem niile ewepụtara n'aha Ezenwaanyị ka ga-adị ire maka njem mana edemede dị n'ime ndị ọhụrụ ga-agbanwe buru aha Eze. Ndị uweojii na mba Ingland na Wales ga-agbanwe apa ha bu n'okpu ha. Ndị ọkaiwu niile amabu dịka counsel Ezenwaanyị ga-aghọrọ counsel Eze ozigbo. Na ngwụcha, abụ njirimara ala ahụ ga-agbanwe kwuo 'God save the King'. Nke a ga-abịa me emechaa mkpọpụta akpọrọ 'Proclamation' n'Obieze St James dị na London." https://www.bbc.com/igbo/articles/c0j18lznwpeo +entertainment Atilogwu Dance: Etu egwu Atịịlogwu siri nweta aha ya "Otu egwu Atiilogwu bụ egwu e jiri mara ndị Igbo. Ya bụ egwu agaala mba niile n'ala Naịjiria nakwa mba ofesi n'aha ndị Igbo. Egwu Atilogwu so n'egwu bụ ọkaibe n'emume 'Festical of Arts and Culture' (Festac) nke e mere na Naịjirịa n'afọ 1977. Ihe ịtụnanya bụ na ya bụ egwu abụghị egwu ọdịnaala, kama ọ bụ egwụ ndị Udi na Ezeagu bi na Legọs malitere kemgbe afọ 1947. Akụkọ kọrọ na obodo abụọ a dị na Enugwu steeti mụrụ ya bụ egwu n'ebe dị icheiche nke gụnyere Awka, n'Anambara steeti n'afọ 1942. Ha gwara ya bụ egwụ ọgwa tinye ya egwu ọdịnaala ndị ọzọ dịka Ogwurogwu, Ugwuọyakanga, Ọganigwe, na Odegere bụ nke mere ka ọ bụrụ ọpụrụiche dị n'egwu. Nke a mere ka ndị mmadụ jụo ka ""etinyere ya ọgwụ"" bụ naara ya aha ruo taa. Akụkọ ọzọ gbasara ebe ya bụ egwu si bịa bụ na otu Dinta nụrụ ka a na-agba ya bụ egwụ n'ọhịa were mụta ya kuziere ndị mmadụ. BBC amaghị ka nke a ọ bụ eziokwu ka ọ bụ ugha, mana ihe doro anya bụ na otu e si agba ya bụ egwu tụrụ ndị mmadụ n'anya nke ukwuu bụ ihe mere e jiri gụọ ya ""Atiilogwu"" n'asụsụ ndị Ezeagu. N'akụkọ nke mbụ, ka ndị obodo abụọ a mụtara ya bụ egwu mechere gbasaa, ndị Ezeagu bi na Lagọs jidesie nke ha ike mee ka ụmụ ha na ụmụụmụ ha mụkwaa ya bụ egwu. Mgbe agha Naịjirịa na Biafra biri, ndị Ezeagu bi na Legọs dịka Sylvester Nwokeocha Nzekwe, Emmanuel Ume, Innocent Ozoeze, Peter Onyema, Christopher Onah na ndị ọzọ buru ya bụ egwu lọta Enugwu bụ be ha nọzị kuziwere ya ndị ọzọ. Akadieze Ambrose bụ onyeisi ndị egwu a so na ndị mụtara ya n'aka ndị a akpọrọ aha ha ma na-etekwa ya ugbua. Ọ kọwaara BBC ka ha siri malite nakwa ka ha sị akuziri ya ndị ọzọ, ihu na ya bụ ọkụ agaghị anyụnahụ ha n'aka. Kirie ya ka ị ịhụ ka ha si eme ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61455901 +politics Chuba Okadigbo: Ihe ise mere Igbo agaghị eji echefu ' Oyi of Oyi' "Taa bụ abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Septemba ka o mere afọ iri na asaa Chuba Okadigbo bụ aha onye ọbụla ma ihe ekwe na-akụ na ndọrọndọrọ ọchịchị Naijirịa ma nke ọma, jiri laa mụọ. Dike Igbo a bụ ọkammụta n' okwu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ onyeisi ndị Ụlọomeiwu Ukwu nke Naijirịa site n'afọ 1999 rụo afọ 2000. Ọ bụ mgbe Olusegun Obasanjo nọ n'oche dịka onyeisiala Naijirịa ka Okadigbo banyere n'ọkwa onyeisi ndị Ụlọomeiwu Ukwu nke Naijirịa. Na-agbanyeghị na ọ nwụrụ mgbe ọ di afọ iri isii na abụọ, ndụ o biri mere na ọtụtụ ndi Naijirịa ọkachasị, nfdị Igbo agaghi echefu ya. Lee ihe ise gbara ọkpụrụkpụ e ji echeta ya: 1. Njem ya n'ime Gọọmenti na ndọrọndọrọ ọchịchi Naijirịa E mere Chuba Okadigbo onye ndụmọdụ onyeisiala Naijirịa mgbe Shehu Shagarị bụ onyeisi obodo n'afọ 1979. O soro na otu 'Social Democratic Party' mgbe a chọrọ i nyefe ndị nkịti ọchịchị n'afọ 1993. Okadigbo nọ n'otu 'Peoples Democratic Movement' mgbe Sani Abacha chọrọ inyefe ndị nkịtị ochịchị. Mgbe gọọmentị nke Fourth Repuplic nọ n'ọchịchị ka a hopụtara ya dịka onye omeiwu na-anọchịte mpaghara Anambra North. Ụfọdụ na-atụ anya na ọ bu ya ga-abụ onyeisi ndị omeiwu kama ọ bụ Evans Enwerem ka ndị omeiwu họpụtara dịka onyeisi ha. Kama o rughị otu afọ e wepụ Enwerem dịka onyeisi ndị ụlọ omeiwu maka ebubo nrụrụaka. E mechara jiri Okadigbo dochie anya Evans Enwerem. Ndụ ụlọomeiwu mechara wepụ Okadigbo dịka onyeisi ndị ụlọ omeiwu maka ebubo nrụrụaka. Mana Okadigbo bụ a-kwaa-a-kwụrụ, e meechara ọ laghachịrị dịka onye omeiwu na-anọchịte ndị mpaghara Anambra -South n'Ụlọomeiwu Ukwu. N'afọ 2003 ka Okadigbo na Muhammadu Buhari soro zọọ ọkwa onyeisiala Naijirịa dịka osote Buhari n'ọkọlọtọ 'All Nigeria Peoples Party' mana Olusegun Obasanjo na Atiku Abubakar nke 'PDP meriri ha. 2. Mgbe mkpọrọ ọchịchị ụlọomeiwu Naijirịa larụrụ Ogbunike. Otu ihe mere nke ndị mmadụ aghaghị echefu bụ na Chuba Okadigbo dịka onyeisi Ụlọoimeiwu Sineti bu ọfọụlọomeiwu laa n'ụlọ ya n'afọ 2000. Akụkọ na-akọwa na ọ bụ ka Okadigbo nụtara kepukepu na a chọrọ iwepụ ya dịka Onyeisi Sineti, ya emechie ọgbakọ ha nwa oge, buru ọfọ ụlọmeiwu nke Bekee kpọrọ 'Mace' laa n'obodo ya bụ Ogbunike n'abalị iri atọ na otu ọnwa Maachị afọ 2000. Dịka iwu siri dị, enweghị mkpebi ọbụla e mere ga-enwe isi ma ọ bụru na ya bụ ọfọ ụlọomeiwu anọghị ya. Mgbe ndị uweojii bịara ụlọ ya ị nara ya ọfọ ọchịchị ahụ, ọ gwara ha na ọ ga-anwụ tupu o kwere ka ha were ya. Mana mbọ ahụ ọ gbara amịtachaghị mkpụrụ n'ihi nkata a kpaara ya nke ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na-arụ onyeisiala oge ahụ bụ Olusegun Obasanjo aka, mechara kpudo ya. E mechara wepụ ya n'ọchịchị dịka onyeisi Sineti. 3. Oyi bụ onwe maara etu e si ahazi okwu Ihe ọzọ ndị mmadụ ji mara Okadigbo bụ na ọ bụ onye nwere nka ịhazi okwu ọ na-atọ ka nnu na ntị ma juputa na nnukwu amamihe. Iji maa atụ, ọ sị ""Ọ bụrụ na ịhụnanya agbụrụ maọbụ okpukperechi maọbụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị mechiri gị anya nke na ịgaghị akwado eziokwu maọbụ ikpe kwụ ọtọ, mara na agụmakwụkwọ ma amamihe gị lara n'iyi. Ọ bụrụ na inweghị ike ichemi echiche dị ka onye nwere akọnuche, mara na ị bụ ọghọm."" 4. Agụmakwụkwọ Chuba Okadigbo Dịka onye agụm akwụkwo na-amasị, Chuba Okadigbo nwetara asambodo Masters na Political Science, ma nweta kwa asambodo dịka ọkammụta na Philosophy na Political sceince. Okadigbo rụru ọru dịka onye nkụz�� na mahadum Howard University nke mba Amerịka. 5. Chuba Wilberforce Okadigbo ( Disemba 17, 1941 - Septemba 25, 2003) Chuba Okadigbo bụ nwaafọ Umueri, nke dị n'obodo Ogbunike n'okpuru ọchịchị Oyi nke di na Anambra steeti. A mụrụ ya n'Asaba Delta steeti n'afọ 1941. Okadigbo nwere asambodo ndọrọndọrọ ọchịchị nke Mahadum nke Catholic Universoty Of America dị na Washington DC, ma tụru ugo dịka ọkammụta n'agụmagụ Philosphy na Political Science. Dịka ezigbo nwaafọ Oyi ọ bụ, e chịrị ya echichi dịka 'Oyi Nke Oyi'. Okadigbo nwụrụ n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Sepụtemba afọ 2003 site n'aka nsogbu iku ume. O mere ihe ndi a nile n'ime afọ abụọ site n'afọ 1973 ruo afọ 1975. Okadigbo rụkwara ọrụ na Mahadum nke University Of Nigeria nke di na Nsụkka dịka ọka nkụzi nke Political Sceince ma rụọ kwa dịka ọkankụzi na Bigard Memorial Senior Seminary nke dị n'Enwugwu Steeti. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-54299398 +health Chidiebere Ibe: Ihe mere m ji jiri eserese isiojii egosipụta ọrịa na ahụike mmadụ Chidiebere Ibe wuru ewu na soshal midia maka eserese akụkụ ahụ onye isiojii nke ndị ọrụ ahụike ji egosipụta ọrịa. Ndị mmadụ na soshal midia ji obi ụtọ nabata eserese ya maka na ọ bụ ihe pụrụiche na-egosipụta nsogbu ahụike n’eserese onye isi ojii. N'ihe onyoonyo a, Ibe gwara BBC Igbo na o bụ n'ụlọakwụkwọ mahadum nke ndị dibịa Oyibo ka o bidoro nwewe mmasị ina-ese ndị mmadụ maka nkọwa ya bụ ahụ mmadụ site n'iji ndị isiojii. Ọ sị na kwaizu ka o ji egosipụta ya bụ eserese ya n'igwe soshial midịa mere ndị mmadụ jiri nwe ihe itunaya maka ihe eserese ya. O kwukwara na o nwere mmasị iji ihe eserese ya kuzie ndị ụmụakwụkwọ dọkịnta ka e ji eserese ndị isi ojii ji mụta ka ahụike ndị ma nleta ndị isi ojii kama iji eserese nke ndị ọcha nke ukwuu. Ibe na-atụanaya na eserese ya ndị a ga-abara ndị ụmụakwụkwọ na-amụta ọrụ dibịa Oyibo n'Afrịka ezigbote uru. Kirie ihe onyoonyo a ka i hụ ka nwa amadị a bụ Chidiebere Ibe ji eji igwe kọmpụta eseta ihe ndị a. Ibe bụ nwa akwụkwọ na-agụ akwụkwọ ịbụ dibịa oyibo. O buruụzọ gụọ Kemistrị na Mahadum Uyo. Ugbua ọ na-agụ maka nsogbu ụbụrụisi na mahadum Kyiv dị na mba Rọshịa. O nwekwara akaọrụ n’ịse ihe kama na ụdịrị ihe ọ na-ese bụ eserese gbasara ngosipụta ọrịa na ahụike mmadụ. Eserese ya nke gosiri nwa ka dị nne isiojii n’afọ wuru ewu n’ịntaneti dịka ọtụtụ mmadụ nabatara ya. O wuruewu n'igwe soshial midịa mgbe o gosipụtara eserese ahụ ndị isiojii ndị o sere mere ka ndị mmadụ nwe mmasị n'ihe o sere. Chidiebere kọwara na ọtụtụ ọrịa ndị egbu ndị isiojii ekwesịghị ma ọ bụrụ na ndị nna nna anyị maara ka ọrịa ndị a si emetụta ndị isiojii site n’eserese ya. Ọ gara n’ihu kọwaa na site na esrese ya, ị ga-ahụ na usoro e ji agwọ onye ọcha n’otu ọrịa abụchaghị usoro e kwesịrị i ji gwọọ onye ojii. O nwere olileanya na a ga-ebido iji eserese ndị isiojii akụziri ndị mmadụ ihe n’ụlọakwụkwọ ndị ahụike. Kirie akụkọ a ka ị hụ ka ịhụ ka Chidiebere is kọwaa ya. Ndị mere akụkọ a bụ Grace Ekpu, Makuochi Okafor na Nnamdi Agbanelo. https://www.bbc.com/igbo/afirika-60137597 +health Fertility Checks: Ajụjụ dị oke mkpa i kwesiri ịjụ onye nke gị tupu unu alụọ "Alụmdi na nwunye abụghị egwu achị ụtaba n'aka agba. O kwesịrị na ndị ọ dị n'obi ịlụ ga-ajụ ajụjụ dị mkpa banyere ahụike ha, ọkachasị ọnọdụ ịmụta nwa tupu ha alụwa. Lee ụfọdụ ese dị mkpa na nwoke na nwaanyị ga-ajụ banyere onwe ha tupu ha biri ka nwaanyị na di: 1. Ị riaala ọrịa nsina mmekọ mbụ? Ọrịa nsina mmekọ nke Bekee kpọrọ ""Sexually transmitted Infections"" bụ ọrịa na-emebi akpa amụ maọbụ akpa akwa (gonads) ma ọ bụrụ na a gwọghị ya n'oge. Dọkịta Ayodeji Oluwole nke Lagọs University Teaching Hospital kwuru na ""ọ bụrụ na agwọghị ọrịa 'Gonorrhea', 'Syphilis,' 'Chlamydia', 'Hepatitis B', n'oge maọbụ na-agwọghị ya ọfụma, ha nwere ike imebi akụkụ ahụ metụtara ọmụmụ nwa."" Nghọta ụfọdụ bụ na ọ bụ naanị nwaanyị na-agba 'alabanko' na-emebi ihe e ji amụ nwa n'ihi ọrịa so inwe mmekọrịta, mana ka ọ dị be oke ka ọ dị be ọgịnị. Idina onye ọbụla na-enweghị mgbochi nwere ike imetụ nwoke n'ihi na ọrịa nsina mmekọ taa akụ n'ime ahụ nwoke, o nwere ike ime ịmetụ mmiri amụ maọbụ mee ka mkpụrụ nwa ghara ịdị n'ime ya (azospermia) . Cheta na ihe mere ụfọdụ ime ji apụ nwaanyị bụ n'ihi na mkpụrụ nwa si na-ahụ nke nwoke ejighị ahụ. 2. Gịnị bụ 'blood group' gị? E nwere otu ọbara anọ, Otu 'A', otu 'B', otu AB na otu 'O'. Ndị ọkachamara na-ekwu na ọ bụrụ na nwaanyị nwere Rhesus- negative (Rh−) lụọ nwoke nwere 'Rhesus- positive' (Rh+) dị ime mbụ ya ọ bụrụ 'Rhesus- positive' (Rh+), o nwere ike isi n'alọ (placenta) banye n'ọbara nwa ọzọ butere ya ọrịa a kpọrọ ""rhesus Disease"". Dkta Joseph Akinde, onye nwe ụlọọgwụ Livingspring Hospital, Ejigbo, Legọs kọwara na ""nke nwere ike ime ka ime pụọ nwaanyị, maọbụ a mụọ nwa ahụ ọ nwụọ, maọbụ o nwee ọrịa obi, maọbụ nke ụbụrụ, maọbụ nwa ahụ enwe ọrụsị."" Ọ bụghị na nwaanyị nwere 'Rhesus- negative' agaghị alụ di, kama ọ dị mkpa ịmata nke a n'oge iji gbochie ọdachi amaghị ama. A na-agba nwaanyị nwere ya ọgwụ awa 72 o ji mụcha nwa iji mebie nke Bekee kpọrọ ""Rhesus-positive cells"" si n'ahụ nwa ọhụrụ banye ya n'ahụ. Nwaanyị mụrụla nwa mbụ maọbụ nke terela ime mbụ nwere ike inwe nsogbu a. 3. Nke nwaanyị ọ tụọla ime mbụ? O teela ime mbụ? Nke a dị nnukwu mkpa n'ihi na dịka dọkịta akụ ike ụmụnwaanyị bụ Ngọzị Obi siri kọwa ọ bụrụ na ọ tụọla ime mbụ ya bụ na o nwere ike ịtụ ọzọ. Obi kwukwara na ọ bụụ na oteela ime mbụ, o nwere ike ibute nsogbu ga-eme ịtụ ime ọzọ ahịa ahụ. Ndị ọkachamara na-ekwu na ite ime nwere ike ime ka ọcha dị nwaanyị n'akpa nwa nke nwere ike ibute ọgbachị na 'fallopian tube' nke nwereike ime ka ọ ghara ịtụnwụ ime. Oke ite ime nwekwara ike ibute akpanwa enwenwughị ike ijidenwu nwa nke Bekee na-akpọ 'cervical incompetence'. 'Cervical incompetence' dịka ka ndị ọkammụta siri kọwaa, na-eme ka ime na-apụ ụfọdụ nwaanyị. 4. O nwere ọrịa ala ala? Ọrịa ala ala dịka varicocele , prostatis-ọrịa na-emetụta agede (prostate) - na ọrịa shuga nwere ike ime ka o sie ike nwoke ịtụwali nwaanyị ya ime. N'ụmụnwaanyị, ọrịa ala ala dịka ""endometriosis"" nwere ike ibute amụtaghị nwa, ebe ọrịa shuga nwere ike inye nwaanyị nsogbu n'afọ ime.' O nweela atụmatụ igbochị ịmụ nwa imerela na mbụ? Ajụjụ a dị mkpa n'ihi na atụmatụ ọbụla nwere ihe so ya nke nwere ike imetụta ịmụ nwa. Ụmụ ole ka ụnụ ga-amụ? Nwoke ole, nwaanyị ole? so na-ajụjụ dị mkpa ụnụ kwesịrị ịjụ ma saa onwe ụnụ. 5. Kedụ oge i bidoro hụwa nsọ gị? Oge nwaanyị bidoro hụwa nsọ ya maọbụ ụgboro ole ọ na-ahụ ya n'afọ (ọ dị 'regular' ka ọ dị 'irregular'), nwere ike ịrụtụ aka otu ọnọdụ ọmụmụ nwaanyị. Dr Joseph Akinde kọwara na ime nwere ike siere nwaanyị na-ahụ nso ya naanị ugboro abụọ maọbụ atọ n'afọ ike. 6. Kedụ mgbe o ji enwe 'ovulation' ya Nwoke ịma ma onye nke ya ọ na-ama oge ọ nọ n'izi (ovulation) n'ihi na ọ bụrụ na ọ naghị anọ n'izi, ị mara na ọ ga-enwe nsogbụ ịmụ nwa. Dọkịta Obi sị,""Ihe ọ pụtara na ya bụ nwaanyị anaghị eyi akwa. Mkpa ọzọ ọ dị dịka ndị ọkachamara siri kọwaa bụ na ọ ga-enyere ha abụọ aka ịmata oge ha ga-anọkọ ime achapuo nakwa oge ha kwesịrị ịnọrọ onwe ha ma ọ bụrụ na ha achọghị nwa. 7. Gịnị bụ 'Genotype' gị? Ọ bụ 'A', 'AS' ka ọ bụ 'SS'? Onye nwere ọbara otu 'A' nwere ike ịlụ onye masirị ya, asịrị agaghị ịba ya. Mana onye nwere AS lụọ onye nwere AS ha nwere ohere pasentị 25 ịmụta nwa nwere ọrịa 'sickle cell.' Dọkịta Akinde kwuru na ị mata nke ị bụ ga-enyere gị aka ịgbalahụ ịmụ nwa nwere sickle cell anaemia. Ọ gara n'ihu kwuo,""ilekọta nwa nwere sicjkle cell adịghịghị mfe. Ọ na-erikwa ego."" O kwesịrị ka ndị chọro ịlụ onwe ha mee nnyocha ọbara iji mata ma ha enwere nje ọrịa HIV. Cheta na HIV bụ ọrịa a na-eke site na mmekọ, iji ihe dị nkọ onye bu ya bụ nje jiri mee ihe. Nnyocha ndị ọzọ dị mkpa gụnyere innyocha ahụike mkpụrụ nwa(sperm) nke Bekee kpọrọ 'seminal analysis'. Nchọpụta sayensi na-egosi na ụmụnwoke nwere mụmp oge ha dị na nwata na-enwe nsogbu ịtụwali nwaanyị ime ma ha tozuo dimkpa. 'Mump' bụ ọrịa na-emetụta akụkụ ahụ na-emepụta asọmmiri nke na-ebute akwakanti(nti ịza aza) nke a na-ekute n'asọmmiri onye bu ya.. Ụlọọgwụ Mayo Clinic rụtụrụ aka na 'mump' nwere ike ibute ntị ochichi, ọrịa obi, ime ipụ maọbụ bute mee mkpụụ amụ nwoke ịzawa aza ma otoruo okoro bịa Ọ dị mkpa ịmata na mmadụ nwere ike izu oke, na enweghị ọrịa ọbụla maọbụ nkwarụ ọbụla mana ha lụọ onwe ha, ime e sierie ha ike. Nke a ka Bekee na-akpọ 'unexplained infertility' nke bụ ime isi ike amaghị ihe butere ya.' Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51945740 +health 'Asymptomatic', 'Lockdown' na okwu ndị ọzọ coronavirus gbara n'anwụ "O ruola ọnwa ise ọrịa coronavirus nke a kpọrọ Covid-19 malitere ịcha ụwa ọkụ. N'ime ọnwa ise a, ọtụtụ mmadụ anwụọla, ọtụtụ mba emechiela ebe okwu dị iche iche gbalitere eru ma bụrụ mbụ ụfọdụ ndị mmadụ na-anụ maka ha. Ụfọdụ okwu ""ọhụrụ"" ndị a bịara dị ka ọgbara Igbo gharịị makana ọtụtụ ndị ọ bụ mbụ ha ị nụ ya aghọtaghị ihe ya bụ okwu na-akọwa. Mana ugbua a ị batara n'akụkọ a, ụjọ atụla gị ma ọ bụrụ na okwu ndị a na-ada gị ka igwe na ntị, makana BBC Igbo ga-akọwara gị ya etu ị ga-esi ghọta ya ugbua. Pandemic: Nke a bụ nke a na-akpọ ọrịa ozuru ụwa ọnụ n'Igbo. Njirimara ya bụ na ọ bụ ọrịa na-efe efe site na mmadụ fere na mmadụ ma na-agazu ebe dị iche iche dịka n'obodo ruo obodo maọbụ site na mba fere na mba n'otu oge. Ụzọ ọzọ e nwereike isi akọwa ya dị ka ilu Igbo na-ekwu na ""onye a na-agwọ ibi ọ na-eto afọ"". Index case: Nke a bụ ihe a na-akpọ onye mbụ butere ọrịa na-efe ọtụtụ mmadụ. Ọ bụ onye na-egosi na e nwere ọrịa na-efe efe. Marakwa na ọ bụghị iwu na ọ bụ onye ahụ butere ya bụ ọrịa, kama na o nwereike ịbụ onye ahụ ka e nyochara wee hụ na ọ bụ n'aka ya ka ọrịa a si gafee n'ahụ ndị ọzọ. Herd immunity: Nke a pụtara nchekwa a na-enye ọha iji gbochie mfesa ọrịa ọkachasị ma ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ anatala ọgwụ mgbochi maka ya bụ ọrịa. Nke a na-enyere aka ịhụ na ọrịa na-efe efe efesaghị ruo ndị na-ebutebeghi ya, n'ihi na ndị ihe dị n'ime ahụ mmadụ na-alụso nje ọgụ nke bụ ""immunity"" ha na-arụsi ọrụ ike nwereike inyere aka ikpuchite ndị nke dị n'ahụ ha akaghị aka. Community transmission: Nke a bụ mgbe mmadụ na onye bu ọrịa na-efe efe enweghi mmekọrịta mana o butekwa ya bụ ọrịa. Ụfọdụ oge ọ bụrụkwa na onye ahụ esighikwa mba ebe ọrịa ozuru ụwa ọnụ na-akpa ike, mana o burukwa ya bụ ọrịa. Lockdown: Nke a ka a na-akpọ mmechi obodomaọbụ mmachibido ịpụta ezi. Ihe ọ pụtara bụ na ndị na-achị obodo ahụ na-etinye iwu ịkwụsị ndị mmadụ ịpụta ezi. Nke a bụ otu ụzọ e si egbochi mfesa ọrịa n'oge coronavirus a. Ọtụtụ mba gụnyere Naịjirịa kpọchiri mba ha makana ndị mmadụ nọrọ n'ime ụlọ ghara inwe mmekọ, o nyere aka ibelata etu ọrịa si efesasị. Vaccine: Nke a bụ nke a na-akpọ ọgwụ mgbochi n'Igbo. E nwere ụdịrị dị iche iche a na-enye maka igbochi ọrịa dị iche iche. Ka ọ dị ugbua, a ka na-achọ ọgwụ mgbochi a ga-eji agwọ ọrịa covid-19. Flattening the curve: Nke a bụ mgbe ndị mmadụ gere ntị n'usoro e ji egbochi ọrịa na-efe efe dịka ịnọ n'ụlọ ghara ibute ma fesasịa ọrịa a. Ndị mmadụ gee ntị ma si usoro dịka ""mmachibido ịpụta ezi"" ọ ga-eme ka ọnụọgụgụ mmadụ ole ga-ebute ọrịa a ghara ibu oke ibu, ma ghara iju ndị na-arụ ọrụ ahụike aka. Ọ dị ka ebe ndị ọrụ ahụike na-asị gị ""nyere m aka ka m nwekwaa ike inyere gị aka"". Immune system: Nke a bụ ihe dị n'ime ahụ mmadụ na-alụso nje na ọrịa ọgụ. Ọ bụghị oge niile mmadụ na-arịa ahụ ka o kwesịrị ịṅụ ọgwụ. Ndị ọkammụta sayensị na ihe gbasara ahụike na-ekwu na ụfọdụ oge ọ na-adị mma iji nri na-edozi ahụ akwalite ime ahụ gị ka ị gbasie ike ma nwee ike ibuso nrịanrịa agha na-aṅụghị ọgwụ ọbụla. A na-eji akwụkwọ nri, mkpụrụosisi nakwa ihe ndị ọzọ dị iche iche akwalite ime ahụ mmadụ iji chebiri mgbe ọrịa dị aṅaa ga-ewelite isi. Asymptomatic: Nke a bụ mmadụibu ọrịa na-efe efe mana ọ naghị egosi ya n'ahụ.Etu a ọrịa coronavirus na-efegharị, e nwere ụfọdụ ndị bu ya mana ọ naghị egosi n'ahụ ha, ọ naghị akutu ha, ha na-agara ụwa ha mkpa ha. Isolation: Nke a bụ ịkpọpụ onye bu ọrịa na-efe efe n'ime otu ebe e wepụtara maka nlekọta ha, ka ọ ghara ibunye ndị ọzọ ya bụ ọrịa. Ụfọdụ oge ọ na-abụ n'ụlọogwụ, ụfọdụ oge ọ bụrụ ebe a rụpụtara maka nlekọta ndị bu ọrịa. Self-isolation: Nke a bụ ọnọdụ nnọrọ onwe, mgbe onye na-enyo ma o nwereike ibu ọrịa a maọbụ onye bu ọrịa a ga-ejiri aka ya chịba ụkwụ n'ụlọ ghara ịpụta ezi, gbajọọ ya na ndị ọzọ inwe mmekọ nakwa ime ihe ndị nwereike ime ka o bufee ndị ọzọ ọrịa. Onye ahụ ga-anọrọ onwe ya naanị ya; ọ ga-azụrụ nri ya n'ịntanetị maọbụ jiri ekwentị zụta ma nri, ọgwụ na ihe ndị ọzọ dị ya mkpa, ghara ịpụta ezi. Quarantine: Nke a bụ mgbe a kpọpụrụ onye ya na onye bu ọrịa na-efe efe nwere mmekọ, iji lelee ya ma hụ ma ọ ga-ebutekwu ọrịa ahụ, ma mekwaa ka ya na ndị ọzọ ghara inwe mmekọ mgbe a na-elele ya. Onye a na-etinye na ""quarantine"" bụ onye nwereike ọ maghị na ya na onye bu ọrịa a enweela mmekọ, maọbụ na o bu ọrịa a mana ọ naghị egosi ya. Social-distancing: Nke a bụ ịgbara ndị mmadụ ọsọ ka gị na mmadụ ghara inwe mmekọrịta makana ị maghị onye bu ọrịa na-efe efe. Nke a bụ na ị nwereike ịpụ apụ mana ị gaghị aga mmadụ nso, o kwesịghị ka onye ọzọ jiri ihe dị ka mita abụọ ruo isii ruo gị nso. Palliative: N'ezie, ""palliative"" bụ nlekọta a na-enye onye nwere ọrịa na-enweghi ọgwụgwọ iji mee ka ihe mgbu ya belata, mana na Naịjirịa, ọ bụ ihe gọọmentị na-akpọ enyemaka a na-enye ndị enweghị etu ọ forọ ha ka ha wee nwee ike jikwata onwe ha. Ọ bụ ihe gọomentị na ụfọdụ ndị mmadụ na-eke ndị nọ n'ụbịam ka ha nwee ike ji chedo afọ ha n'oge ""ụwa yagara ayaga"" a. Stimulus package: Nke a bụ ihe gọọmentị ji enyere ụfọdụ ndị ọ na-achị aka n'oge ihe ndapụta dịka ugbua ọrịa ozuru ụwa ọnụ na-efegharị. Ọ bụ ihe ụzọ a ga-esikwa kwalite akụnụba obodo n'ihi na ego ahụ a ga-enye ndị mmadụ iji nyere ha aka oge ihe ndapụta ga-alaghachikwa n'akụnụba obodo. Hand sanitizer: Nke a bụ ihe e ji ehicha aka nke nwere mmanya ọkụ, nke na-enyere aka ibelata nje mmadụ nwereike iji aka metụta. Curfew: Nke a bụ mmachi ngagharị maọbụ oge apụla ezi n'asụsụ Igbo. N'oge mfegharị ọrịa coronavirus a, gọọmentị dị iche iche etinyela mmachi a ka ha gbochie ndị mmadụ ịpụ ezi aghara agahara ka ọrịa a ghara ifesasị metụta ndị ebughi ya. N'ụfọdụ ebe na Naịjiria e tinyere iwu sị ndị mmadụ apụla ezi site n'elekere asatọ nke abalị ruo nke isii nke ụtụtụ. Personal hygiene: Nke a bụ ọnọdụ nlekọta onwe, ebe mmadụ ga-eji aka ya hazie ma debe onwe ya na gburugburu ya ọcha. Idobe onwe gị na gburugburu gị ọcha ga-enyere gị aka igbochi ụfọdụ ọrịa na nje nwereike ife mmadụ. Face masks: Nke a ka a na-akpọ akwa mkpuchi imi n'asụsụ Igbo. A na-eji ya egbochi ihe dịka ikuku aja na ikuku ọjọọ ndị ọzọ ikubanye mmadụ n'imi. Ọ na-egbochikwa ihe dịka azụzụ, ụkwara, asọmmiri na ihe ndị ọzọ onye ọzọ kwapụtara ịtụsa gị n'imi na ọnụ, ọkachasị nke onye bu ọrịa na-efe efe." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52573270 +entertainment Jude Okoye: Lee etu ndị mmadụ si dọrie Cynthia Morgan ka Jude Okoye gbachara nkwekọrịta ha n'anwụ "Ndị mmadụ adọrịela Cynthia Morgan dịka Jude Okoye gbara nkwekọrịta ha abụọ nwere n'anwụ. N'akwụkwọ nkwekọrịta ahụ, o gosiri na ihe Okoye kwuru banyere etu ya na Morgan bụ otiegwu nọbu n'okpuru ya si wee gawara onwe ha, na nke Morgan boro ya n'ebubo abụghị otu ihe. Mgbe Morgan pụtara n'izuụka gara aga; kemgbe a na-ahụbeghi ya anya ihe ruru afọ abụọ, o kwuru na Okoye so mee ya ihe mere ya, nke otu n'ime ya bụ ịkwụsị ya iji aha ya agụ egwu. O kwuru na ọ chọrọ ịgbanwe aha ya zawa Madrina, mana Okoye jụrụ ajụ, mere ka nsogbu ya bido. Mana Okoye sara ebubo ahụ ka otiegwu a ma dịka Tunde Ednut gbara ya ajụjụ ọnụ, sị na ""kedụkwanụ etu m ga-esi anapụ mmadụ aha nne na nna ya gụrụ ya?"" Ọ gara n'ihu nye Tunde Ednut akwụkwọ nkwekọrịta ya na Morgan binyere aka. Ka a gbara ya n'anwụ, soshal midia nwurula ọkụ dịka ndị mmadụ malitere itinye ọnụ na ya bụ okwu, na-agwa Morgan na ọ tụgidere Okoye asị. Ụfọdụ kwukwara na o ji asị nakwa obi ebere ha na-emetere ya chọọ ịnapụta ha ego. Mana ụfọdụ kpụkwa Okoye n'ọnụ, ma kwuo na nkwekọrịta ya na Morgan adịghị mma, na o megidere ya. Jude Okoye bụ onye tọrọ Peter na Paul Okoye bụ ndị otiegwu e jibu Psquare mara awụọla miri oyi n'ebumnuche ọtụtụ mmadụ na-akwado otu egwu ahụ site n'ikwu na ya agaghị akpọkọtanwu ha. Jude kwuru okwu a dịka ya na onye otiegwu e ji Tunde Ednut mara, nọ na-enwe mkparịtaụka n'elu Instagram. Ọ sị na ihe mere na ọ gaghị emenwu bụ makana ọ bụ ihe gbasara ya kpatara okwu n'etiti ejima abụọ ahụ. N'okwu ya: ""Paul na Peter anaghị ese okwu. Ọ bụ m ka Peter na-esesa okwu, sị ka m ghara isonye n'ihe ọbụla gbasara egwu ha."" Maazị Okoye gakwara n'ihu kwuo na esemokwu nke kapịrị okwu ọnụ, butere mgbasa ha kpam kpam n'afọ 2017, bụ nke ugboro itoolu Peter gbara abụbụ na ya adịghị emezi. ""Aka m na-ajụkwa nwanne m nwoke ihe na-ese. Ya bịa kwuo ihe m mere ya na-agbawa ya obi ka m rịọ mgbaghara ma gbanwee. Mana kemgbe ihe a mere, o kwubeghi na ọ bụ ihe a ma ọ bụ ihe nke ọzọ."" Dịka ndị mmadụ sonyere mkparịtaụka Instagram ahụ na-ajụsi ike ma udo a ga-emecha chịa n'etiti ụmụnne atọ a, Jude sị na ọ bụghị ya ka ọ dị n'aka. ""Ọ gaghị emenwu m n'aka. Onye ọzọ nwereike nwaa. Mana ọ gaghị esi m n'aka."" Jude gbara ama na ya nwere mmadụ atọ tọrọ ya, nke mere na ya abụghị diọkpara na be nna ha."" Ọ sịkwa na ndị mmadụ kwesịrị ịjụ ihe mere ụmụnne ha ndị ahụ na ndị nke obere adịghị etinye ọnụ n'okwu a. ""Mụnwa gbara mbọ nke m. Agara m gaa rịọ arịrịọ ma rịọ nwunye onye asị m gaa riọ, mana onweghi nke kwere Peter nnabata."" Jude sị na ya tara ezigbote ahụhụ oge ọ na-arụ ọrụ 'onye nhazi' otu Psquare, mana si na ọ bụ ka ha gawara onwe ha ka ya malitere ""idochi ahụ"". Okwu a niile pụtara makana Jude sị na ya agaghị agbazi nkịtị dịka nwanne ya ji aha ya agagharị. ""Ụmụ m too kedụ ụdịrị ihe ha ga na-anụ na nna ha mere? Ha a ga-ajụ kedụ ihe i kwuru oge ihe dị otu a mere? Ya mere m jiri na-ekwu okwu ugbua. Agaghị m emechizi ọnụ."" Okwu ọhụru malitere dịka otu otiegwu e ji Cynthia Morgan mara kpọrọ Jude Okoye aha dịka onye ji ya n'ụdọ, mere na ọ naghị aganwu n'ihu. Peter Okoye tinyere ọnụ na ya bụ okwu dịka ọ na-ewu, wee kwụnyere nwaada Morgan. Jude kwuru na mkparịtaụka ya na Tunde Ednut na ọ gaara agba nkịtị, mana ọ bụ okwu Peter mere o jiri kwuo okwu. Ọ gara n'ihu gọnarị ebubo nwaada ahụ boro ya, ma kwuo na ha abụọ gawara ụzọ ""onye na way ya"" kemgbe afọ 2017. ""Mmadụ ọ ga-anapụnwu mmadụ aha nne na nna gụrụ ya? Cynthia Morgan bụ aha ya. Onweghi ụlọikpe n'ụwa a ga-anapụnwu mmadụ aha a gụrụ ya."" Ka ọ kwụ ugbua a, okwu nlaghachite Psquare ka dị n'ime ngịga." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52798582 +politics Herdsmen crisis: Gọọmenti Enugu state amalitela ikpochasị ọhịa na steeti ahụ "Gọọmenti Enugwu steeti ekwuola na ihe mere ha ji asụ oke ọhịa dịcha na steeti ahụ bụ ""iji gbaa n'anwụ ebe ndị ntọ na ndị ohi na-ezo"". Iji mejuputa nkwa gọọmenti Enugwu kwere banyere nchekwa ndụ na steeti ahụ, ha amalitela ikpocha nnukwu ọhịa dị n'Ihe, Four Corner Ozalla-Udi road wee rue n'Obiagu, Udi. Ya bụ atụmatụ bụ nke ha kwuru na ọ ga-enye aka hụ na ndị ntọrị, ndị ohi na ndị ogbu mmadụ enweghịzị ebe ha ga-ezo ọzọ. Mgbe BBC rutere n'ọhịa Four Corner, Akagbe Ugwu nakwa isi Ozalla, ndị ọrụ ha bụ igbutu osisi na-aru ọrụ ha n'ike n'ike. Lee ihe BBC hụrụ ebe ahụ: Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49440190 +health Coronavirus update: Gịnị ka ọ pụtara ma a sị na mmadị dị 'asymtọmatịc'? Lee nkọwa ihe ọ pụtara ma a sị na mmadụ dị asymtomatic? Kedụ mgbe anyị ga-enweta ọgwụ coronavirus? https://www.bbc.com/igbo/afirika-52664649 +sports Nigeria Vs Burundi: Super Eagles amalitela njem ịchọ Iko AFCON nke 4 ha "Iko Mba Afịrịka nke Bekee kpọrọ African Cup of Nations malitere ụnyaahu na mba Ijipt ka mba ahụ na Zimbabwe suru mpi n'ama egwuregwu dị na Cairo. Taata, Super Eagles nke Naịjirịa - bụ ndị tụrụ ugo n'asọmpị a ugboro atọ n'oge gara aga - ga amalite ịchu iko nke anọ ha n'ama egwuregwu Alexandrịa di n'obodo Alexandrịa mgbe ha zutere Burundi. N'ụbọchị nke 26 nke ọnwọa Juun ha ga-ezute otu egwuregwu mba Guinea. N'ụbọchi 30 nke ọnwa juun kwa, ha ga-agba bọọlụ nke agba nke mbụ mgbe ha na Madagascar zutere. Agbanyeghị na Super Eagles so n'otu egwuregwu na-eme ọfụma n'Iko Mba Afịrịka kwamgbe, afọ bụ nke mbụ ha na-agba ya bụ asọmpị kemgbe ha maburu Iko ahụ n'afọ 2013. Super Eagles achịtaghị aja n'asọmpị eji ahụpụta ndị ga-aga Iko Mba Afịrịka n'afọ 2015 nakwa afọ 2017. Super Eagles butere Iko a mbu n'afọ 1980 mgbe Naịjirịa nabatara mba Afịrịka ndị ọzọ. Afọ iri ano gara tupu ha ebute ya ọzọ na Tunisha n'afọ 1994. Ndị ahụ butere mgbe ahụ bụkwa ndị Clemence Westerhof du gawa Iko Mba Ụwa na Amerịka n'afọ ahụ. Afọ iri na itoolu gara tupu Super Eagles hụ Iko ahu anya na mba Saụt Afịrịka. Onye du ha ga Saụt Afịrịka bụ Stephen Keshi - bu onye anọghịzị n'ụwa. Stephen Keshi sokwa n'ime ndị butere iko ahụ n'afọ 1994. Ọ bụ ya bu onyeisi ndi ọgba bọọlụ Super Eagles mgbe ahụ. Ya bụ, Keshi butere Iko ahụ ka onye na-agba nakwa onye nkuzi. Mikel Obi, bụ onyeisi Super Eagles ugbua, sokwa ndị butere Iko ahụ n'afọ 2013. Iko Mba Afịrịka nke afọ bu opuruiche, dịka ọ bu mbu mba 24 ga-ezute na ya bụ asọmpị. Nke afọ a bụkwa nke mbụ ahaziri ka ọ gharị ịdabanye mgbe ndị mba Yurope - bụ ebe ọtụtụ ndị na-agba bọọlụ n'asọmpị a na-atụ mgbere bọọlụ - na-asụ mpị otu egwuregwu dị iche iche. Na mbụ, ọ bụ na ọnwa Febuwarị ka a na-agba asọmpị a. Dịka ọkwa ha dị n'Afịrịka, onweghị ndị n'ime ndị ha na Super Eagles nọ na ""Group"" enwereike sị na aka siri ike ruo ha n'asọmpị bọọlụ, nke mere ọtụtụ mmadụ na-eche na ha ga-pụta na agba nke mbụ gaa agba nke abụọ. Mana, ndị ma egwuregwu bọọlụ ọfụma na-ekwu na onweghị onye a ga-asị na ọ bụ obele mmadu n'ama egwuregwu." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48729283 +religion Akụkọ kachasị n'��tụtụ a: Ndị Bishọp Katọlik ehiwela ngagharịiwe Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a Ndị Bishọp ụka Katọlik ehiwela ngagharịiwe Ndị Bishọp ụka katọlịk na Naịjirịa ehiwela ngagharị iwe n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee maka ndị ụka ha gụnyere ndị ọzụzụ atụrụ abụọ egwuru na Benue Steeti n'ọnwa gara aga Ngagharị iwe a ga-eme n'ụbọchị ahụ aga-eli ndị a nwụrụ anwụ ma kpọkuo ndị ụka Kraịst niile ga ha gbakọta aka ọnụ mee ya bụ ngagharị iwe. Gọvanọ Rochas Okorocha na ndị ndu APC na-alụ ọgụ Ọgbaghara ka na-aga n'ihu na pati APC nke Imo Steeti dịka Gọvanọ Rochas Okorocha ebola ndị ndụ APC bụ National Working Committee ebubo na aka ha dị na ya. Na nzaghachi, onye odeeakwụkwọ APC bụ Bolaji Abdullahi gwara Gọvanọ Okorocha na ọ bụ enweghi ike ịhazi mmekọrịta dị n'etiti ya na ndị nke ya bu nsogbu ya, ya ebokwasila ndị ndu APC ihe o wetara onwe ya World Health Organisation (WHO) Otu na-ahụ maka ahụike n'ụwa bụ World health Organisation ekwuola na ha na-atụ anya ibubata ọgwụ nyọcha maka ọgwụgwụ ọrịa ebola na mba Congo na mbido izuụka a. Ha kwuru na ruru ọnụ ọgwụ puku anọ bụ ihe a ga-eziga n'ebe ahụ. Barcelona amala afọ n'ala na ebumnobi ha ịbụ ndị anaghị emeri emeri n'asọmpị La liga nke afọ a. Ebe Neymar turula ugo dịka ọkacha agba bọọlụ na France Lig Une Rangers na Akwa United enwetaghị goolu ọbụla dịka ha zutere onwe ha n'asọmpi NPFL nke izuụka Iri abụọ na otu. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji https://www.bbc.com/igbo/afirika-44106501 +sports Ukraine and U20 world cup: South Korea eburula ihe na-esi n'iko mbaụwa U20 Ndị egwu bọọlụ mba Ukraine ewerela ọkpụ goolụ atọ asatara otu merie Saụt Korea were maburu iko mbaụwa ndị erubeghị afọ iri abụọ agbara na mba Poland taa bụ Satọde. Mmeri a bịara ka ndị Saụt Korea nwetechara penariti n'ụzọ ụtụtụ ya bụ egwuregwu na nkeji ise bụ nke Lee Kang-in tinyere ha na goolu. Flying Eagles ejirila ikiriki eze gafee Otu Naịjirịa alaferela n'asọmpi AFCON U20 Mana Ukraine gwara Saụt Korea na ha apụtaghị egwu ọnwa mgbe Vladyslav Supriaga sara ya bụ goolu na nkeji iri atọ na anọ. Vladyslav Supriaga kwuru n'ezie na-ejighị ụtụtụ ama njọ ahịa na nkeji iri ise na atọ bụ mgbe o tinyere goolu nke abụọ ya n'ọnụ mpiọ ndị Saụt Korea. Ndị Korea kpọkwara ganịganị ọtụtụ mgbe mana Ukraine gwara ha na ogologo abụghị na nwa m etoola mgbe ha mezuru ya ọkpụ atọ site n'aka Giorgi Tsitaishvili na nkeji iri asatọ na itoolu. Ụwa gbara Saụt Korea gharị mgbe opi ike daara na ngwụcha ya bụ egwuruegwu. Nke a bụ mbụ Ukraine na-emetu ya bụ iko mbaụwa aka ka England buchere ya afọ abụọ gara aga. 'Kedụ ihe m bịara ime ma ọbụghị ibu Iko AFCON' - Mikel Obi Uloikpe mkpegharị eweliela Chimaroke aka elu ọzọ Ọzọdịmgba eloro nde naira asaa n'ogige ụmụanụmanụ nke Kano? https://www.bbc.com/igbo/afirika-48634019 +entertainment Igbo hairstyles: Ụdịrị isi e ji mara ndị Igbo mgbe gboo Site n'afọ 1900 ruo ugbua, ọtụtụ ihe agbanweela, mana mgbanwe ndị ahụ abụchaghị nke a tụfuru atụfu. Otu n'ime ihe ndị ahụ gbanwere bụ isi ọkpụkpa ndị mgbe gboo na-akpabu. A na-akpakwa isi ugbua, mana ọtụtụ ndị amaghị na ụfọdụ isi ndị ahụ bụ ndị a kpara mgbe gboo. Ihe nkiri a ga-egosi gị ụdịrị isi e jiri mara ndị Igbo mgbe gboo. Ndị mere ihe nkiri a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Chukwunaeme Obiejesi. https://www.bbc.com/igbo/afirika-54131997 +health Anti malarials abuse : 71% ndị Naijiria-aṅụ ọgwụ ịba enweghị ịba "Ọtụtụ ndị mmadụ rịawa ọrịa na Naijiria, ha agbara ga zụọ ọgwụ ịba, mana mmadụ ole n'ime ha nwere ọrịa ịba n'ezie? Nchọpụta ọhụrụ nke edepụtara n'akwụkwọ 'Texila International Journal of Public Health' gosiri na imerime ndị na-aṅụ ọgwụ ịba na-abụghị dọkịta sị ha ṅụọ enweghi ọrịa ịba n'ahụ ha ma ncha. Onyendu ndị mere nchọpụta a bụ Oche Joseph Otorkpa bụ onyeisioche ngalaba na-ahụ maka ahụike ọha na Naijiria. Otorkpa na ndị otu ya nyochara mmadụ 470 bụ ndị gara zụrụ ọgwụ ịba na-abụghị dọkịta sị ha zụọ, wee chọpụta na `336 n'ime ha enweghi 'Plasmodium falciparum antigen' n'ọbara ha bụ nje na-ebute ọrịa iba. 'Plasmodium falciparum' bụ nje kacha akpata ọrịa ịba na Naijiria nakwa Afrịka, ebe 'antigen' bụ ihe ga-adị n'ọbara mmadụ nke ga-egosi na mmadụ ariabuola ịba. Nchọpụta ahụ kwuru na mmadụ iji aka enye onwe ya ọgwụ (self medication) jọgburu onwe ya maka na ọ na-eme ka mmadụ na-agwọ ọzọ, ebe ọzọ na-aria ya. BBC Igbo kpọtụụrụ Dọkita Theresa Nwachukwu, onye ọkachamara na ihe gbasara ahụike ọha, o wee kọwaa na nchọpụta ah�� dabara n'anya ya. Nwachukwu kwuru na otu ahụike mba ụwa bụ 'World Health Organisation' adọọla aka na ntị ka a ghara inye maọbụ gbaa mmadụ ọgwụ ịba ma ọ bụrụ na-ebughi ụzọ nyochaa onye ahụ ma chọpụta na o nwere ịba n'ezie. O kwuru na ""mmadụ iṅụ ọgwụ na-abụghị nke orịa na-aria ya ga-eme ka ọgwụ ahụ ghara ịdịzi ire mgbe onye ahụ ga-ariawa ya bụ ọrịa n'ezie."" ""Ọ dị mma na mmadụ ga-ebu ụzọ gaa nyocha ma chọpụta ihe na-eme ya tupu ọ ṅụwa ọgwụ."" Dkta Otorkpa na ndị otu ya tụpụtara alo wee rịọ gọọmentị etiti ka ha mee ka ụlọinyeọgwụ (pharmacy) niile nwee nke a kpọrọ (Rapid Diagnostic Kits) nke ha ga-eji na-enyocha ndị mmadụ tupu e nye ha ọgwụ ịba. Nchọpụta edere n'akwụkwọ 'Texila International Journal of Public Health' gosiri na mmadụ dị pasentị iri asaa na otu na-aṅụ ọgwụịba enweghi ịba n'ezie. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/48886734 +health Nafdac: Ịtụbata ọgwụ ka uru karịa ịkụ ya - Azubuike Chukwumereije "Ndị na-akụ ọgwụ n'ala Igbo akọwala ihe mere ọgwụ a na-atụbata ji karịa nke a na-akụ na Naịjirịa. Onye ọkụ ọgwụ bụ Azubuike Chukwumeriji sị na-atụmatụ gọọmenti hibere maka ịchekwa ya bụ ọrụ karịrị ike, na-eri oge ma dịkwa okeọnụ. Azubuike sị na-enweghị akụrụngwa, na oke ụtụisi a na-ana ha bụ ụfọdụ ihe n'echere ha akamgba na ya bụ ọrụ. Ọ sị, "" ego ọ na-eri anyị iji mepụta ọgwụ karịrị ego eji atụbata otu ọgwụ ahụ. A na-anakwa anyị ọtụtụ ụtụisi tinyere enweghị ọkụ bụ nke na-adọhachị anyị akaelekere azụ"". Azubuike maraatụ na ya ma ndị otu ha mechichere ebe ha na-akụ ọgwụ gazia bubatawa ọgwụ maka nsogbu ndị a. N'agbanyeghị nke a, ọ sị na ụfọdụ ndị otu ha anaghị enwe ndidi ka ọrụaka ha mitawa mkpụrụ, na ha chọrọ ego ọkụọkụ nke taa nke echi. Otu na-ahụ maka ịchekwa ọgwụ na ahịa ọgwụ bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (Nafdac) kwuru na ụzọ asaa n'ime iri bụ ọgwụ a na-aṅụ na Naịjirịa sị mba ofesi, ebe atọ nke ọzọ si obodo a. Ebe ndị na-akụ ọgwụ na-eche na ọ ka mma ka ọtụtụ ọgwụ a na-ego na Naịjirịa sị obodo a, onyeisioche ụlọọrụ Nafdac, bụ Ọkankuzi (Prof.) Mojisola Adeyeye sị na ihe ka mkpa bụ nke onye na-eme ya mee ya nke ọma. Azubuike Chukwumerije na-akọwa na ọgwụ ikpo asaa a na-atụbata na Naịjirịa gosiri ego ole sị mba a aga ofesi n'ihi ọgwụ, bụ nke ekwesiri iji tinye n'ọrụ wee ndị mmadụ ọrụ. Mbọ niile BBC gbara ị nụ ọnụ okwu onyeisioche ndị Pharmacitical Society of Nigeria bụ Sam Ohuabunwa amịtaghị mkpụrụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49190685 +politics #BBCGovDebate: Nrụrịtaụka BBC Igbo niile abịala na njedebe Ihe ndị dị mkpa mere taa Nrụrịtaụka ọkwa gọvanọ nke BBC Igbo hibere emechiela taa dịka emere nke Ebonyi steeti n'ehihie ụbọchị Sunde. Cheta na nrụrịtaụka a malitere na Imo steeti metụtakwara Abịa steeti dịka Igwe mmadụ pụtara ịjụ ndị ọchịchị ajụjụ dị ha mkpa. Ọzọ, Onyeisi ụlọụka Redeemed na Naịjirịa bụ Pastor EA Adeboye emerela osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo ụka mmamma n'ụbọchị sunda Nke a bụ maka ụgbọelụ helịkọpta bu ya dara n'obodo Kabba na Kogi steeti n'ehihe satọde. Na mba ofesi, Ụfọdụ ụmụnwanne ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ dị n'obodo New York emeela ngagharịwe maka ọnọdụ esi debe ụmụnwanne ha na mba Amerịka Iwe ha bụ na oyi na-atụgbu ụmụnwanne ha dịka ha enweghi ọkụ latrik maọbụ mkpoọkụ n'oge oke oyi a na mba ahụ. N'egwuregwu, Mmeri otu Manchester United meriri otu Leicester city na mgbede sunde ga-eme ya mmerị itoolu n'ime asọmpị iri otu Man U riterela n'okpuru onye ndu ọhụrụ ha bụ Ole Gunner Solskjaer. Ọ bụ Marcus Rashford nyere ọkpụ goolu ha jiri dọka neetị ndị Leicester Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ Ndọrịtaụka nke BBC haziri maka ndị na-azọ ọkwa gọvanọ jisike aga n'ihu ugbua. Taa ọ ga-akpọtụ n'Ebonyi steeti ebe ndị na-azọ ọkwa gọvanọ na steeti ahụ ga-enwe ndọrịtaụka gbasara etu ọchịchị ha ga-esi bara ndị steeti ahụ uru. Gọvanọ na-achị Ebonyi steeti ugbua bụ Dave Umahi ma bụrụkwa onye otU PDP so na ndị ga-eme ndọrịtaụka a. Ndị ọzọ ga-eso gụnyere Nnaji Igbokwe onye otu pati Accord nakwa Ogbonnaya Okorie bụ onye otu Advanced Allied Party. BBC Igbo ga-ewetere unu ka o sị aga mgbe a ga-amalite ya bụ ndọrịtaụka taa. N'akụkọ ọzọ, Inec etiela aka n'obi Dịka ntuliaka nke afọ a na-akpụkete nso, ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka akpọrọ INEC n'ichafụ ekwuola na ha adịla njikere ịme atụmaatụ a. Onyeisioche ngalaba na-ahụ maka mgbasa ozi na Inec bụ Festus Okoye kwuru na ha ebugala ngwa ọrụ a ga-eji mee ya bụ ntuliaka n'ụlọakụ ukwu bụ Central Bank of Naịjirịa ebe a ga-esi bụga ya ebe ndị a ga-eme ntulaiaka n'abali ga-efopụta ụbọchị ntuliaka. N'ofesi, Enwela nkwekọrịta udo n'etiti otu nnupuisi ruru iri na anọ na gọọmenti etiti Central African Repọblịk ka enwechara mkparịtaụka na mba Sudan. Ọ bụ ndị ozi United Nations nọ na CAR akpọrọ Minusca nakwa Africa union bụ ndị kwadoro ya bụ mkparịtaụka kwuputere nke a. N'egwuregwu, Chelsea ji ọkpụ goolụ ise asataghị otu merie Huddersfield, TottenHam tikwara Newscastle otu ọkpụ goolu asataghị otu, Cystal Palace jikwa ọkpụ goolu abụọ asataghị otu wee merie Fulham ebe Wolves tiri Everton mmanwụ site n'inye ha ọkpụ goolu atọ asatara otu n'asọmpị Premiere League ụbọchị Satọde gara aga. Nkeji taa Ihe nkiri taa https://www.bbc.com/igbo/afirika-47106799 +health Sweet sweet codeine: Nafdac emechiela ụlọọrụ ọgwụ atọ na-arụ codeine "Ngalaba na-ahazi nlekọta nri na mmepụta ọgwụ bụ Nafdac n'aha ịchafụ emechiela ụlọrụ ọgwụ atọ; Bioraj Pharmaceutical Limited , Emzor Pharmaceuticals Ind. Ltd na Peace Standard Pharmaceutical Limited bụ ụlọọrụ a rụrụ aka n'ihe gbasara ire ọgwụ ụkwara nwere codeine n'ụzọ megidere iwu. BBC wepụtara akụkọ so nchọpụta nzuzo ha meere nke gbara n'anwụ ka ụlọọrụ atọ a si jiri ụzọ azụ ụlọ na-eresi ọgwụ a nke e mere n'iwu ka a na-ere naani oge dọkịta nyere akwụkwọ, nye ndị ntorobịa agharaaghara. N'akwụkwọ ozi onyeisi Nafdac bụ Mojisola Adeyeye wepụtara, mmechi a sotara nchọpụta ha mere dịka ha gachara n'ụlọọrụ ndị ahụ. ""N'ihi e nwetaghị ihe akaebe zuru oke na mbọ igbochi iwepụta akwụkwọ kwesịrị oge anyị mere nyocha anyị n'ụbọchị 2 nke ọnwa Mee, n'ụlọọrụ ha dị n'Ịlorin na Lagos, ọ dị mkpa ka e mechie ụlọọrụ mmepụta ahịa ụlọọrụ atọ ndị a - Peace Standard Pharmaceutical Limited ; Bioraj Pharmaceutical Limited na Emzor Pharmaceuticals Ind. Ltd . Nke a bụ iji nye ohere maka nchọpụta zuru oke."" Adeyeye kwukwara na imepe ụlọọrụ ndị a ga-agbado ụkwụ ka ụlọọrụ ndị a si nye Nafac nkwado na nyocha ha. O kwuru na otu Nafdac nke gụnyere ndị ọrụ itoolu; abụọ bụ ndị na-enyocha ọgwụ na asaa bụ ndị nchọpụta n-ahụ maka idewe iwu na ndị uweojii iri gara Ilorin n'ụbọchị ahụ, ị ga mee nyocha ụlọọrụ abụọ e nyere ikike ime ọgwụ ụkwara nwere codeine, ndị a kpọrọ aha n'akụkọ nyocha nke BBC wepụtara. Dika Adeyeye siri kwuo, otu ndị ahụ bụkwa ndị e zigara n'ụlọọrụ Emzor na Lagos. O kwuru: ""Isi ozi e zigara ha bụ ị ga lele akwụkwọ oriri na nkesa ọgwụ ụkwara nwere codeine nye ndị na-aṅụ ya."" O kwuru na Nafdac akpọọla oku nzụkọ ndị ihe gbasara ọgwụ metụtara." https://www.bbc.com/igbo/44036599 +business Naịjirịa ga-ere akụnaụba ọha iji mezuo ego bọjetị 2018 "Naịjirịa na-ele anya na ọ ga-erete ijeri naira 400 na akụnụba ọha nke ga-enye aka tinye ego na bojeti nke 2019, onyeisi ngalaba na-ahụ maka akụnụba ọha kwuru. Alex Okoh, onyeisi ngalaba ahụ akpọrọ ""Bureau of Public Enterprises"" n'asụsụ bekee, kwuru na gọọmentị ahazịela usoro atụmatụ ha ga-eji ree akụnụba gọọmenti, bụ nke ha jiri bụte ego n'aka ulọakụ mba ụwa. Ego a ha bụtere ga-abanye ibulite nkekọrịta ọkụ latrịk, bụ nke ha sị adịghị eme ọfụma. Na mkparịtaụka Okoh na ụlọ ntaakụkọ Reuters nwere na izuụka gara aga, ọ gwara ha na gọọmentị Naịjirịa nwere atụmatụ ire maọbụ inye ụlọ ọrụ ndị nkịtị ihe dị ka ọgbọ egwuregwu na ụlọ ọkụ latrịk. Ndị Reuters nwere na gọọmentị gwakara ha na achọrọ iresi ọha ụfọdụ oke gọọmentị nwere na ụlọọrụ Nigerian Reinsurance Company n'ọnwa Novemba nke afọ a. N'afọ 2013, Naịjirịa bidoro ire akụnụba ọkụ latrịk ya n'uche na ọ ga-enye aka ime ka me ka ọkụ na-adị karịa ka ọ na-adị na mbụ ma webata ego si mba ofesi, mana onweghị otu n'ime ihe mere. Okoh kwuru na ngalaba ọkụ latrịk so n'ime ngalaba 37 ọha erere eritebeghị uru ekwesiri na ha, mana o kwughi akụnụba ole gọọmentị rere. Ọ gakwara n'ihu kwuo na Naịjirịa alabatala ego ruru ijere dọla 7.8 site n'ake ndị mba ofesi ji ego achụ ego. Buhari ebinyebeghị aka n'akwụkwọ eji eke ego nke 2018, bụ nke ga-eme ya iwu. Bọjetị Naịjirịa riri elu karịcha kemgbe Buhari batala ọchịchị." https://www.bbc.com/igbo/afirika-44422954 +politics Presidential Election: Ihe anọ Buhari ga-emere m ka udo were chịa "Akụkọ dị mkpa: Otu ọdịnala na agbụrụ dị na Naịjirịa bụ Ohaneze ndị Igbo, Northern Elders Forum, Middle Belt Forum na Niger Delta Forum etinyela aka n'akwụkwọ ịgwado Atiku ịgawa ụlọikpe maka ịlebe anya na-atụm vootu emere ụbọchị satọde nke ha kwenyere na ozighịezi. Ndị tinyere aka na ya bụ akwụkwọ bụ ndị isi otu ndị dịka Ọkamụta Ango Abdullahi, Chief John Nwodo, Chief Ayo Adebanjo, Chief Edwin Clark na Dkt. Pogu Bitrus. Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ndị ọnụ na-eru n'okwu na Pati APC achụpụ Rochas Okorocha na Ibikunle Amosu nke Ogun steeti na pati ha. Ndị niile BBC kpọrọ maka ịmata nke bụ eziokwu n'akụkụ a kwọchapụrụ aka na ụkwụ ha na ya bụ akụkọ. APC achụpụla Rochas? Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ndị ọnụ na-eru n'okwu na Pati APC akpawala nkata ịchụpụ Rochas Okorocha na Ibikunle Amosun nke Ogun steeti na pati ha. Ndị niile BBC kpọrọ maka ịmata nke bụ eziokwu n'akụkụ a kwọchapụrụ aka na ụkwụ ha na ya bụ akụkọ. Ndị omekome wakporo ụmụnwaanyi ebe a tụrụ vootu Inec ekwuola na-awakporo ụmụnwaanyị bụ ndị ọrụ ngo mgbe e mere ntụlịaka onyeisiala na Satọde gara aga. Agbanyeghị na Inec sị na udo chịrị na ọtụtụ ebe e mere ya bụ ntụlịaka mana ọgbaaghara dị n'ebe ụfọdụ nke ha akọwaghị nke ọma. Akpabio akwụsịla Inec inye Chris Ekpenyong asambodo Sen. Godswill Akpabio kwuru na ya anatala ụlọikpe ikike ịkwụsị Inec ịnye Chris Ekpenyong nke PDP asambodo meri maka ntụlịaka ha mere ụbọchị Satọde mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na atọ. Akpabịọ sị na nke a ga-enye aka inyocha ihe mgbagwoju anya mere mgbe a tụrụ vootu ahụ. Edoola nwaanyị mbụ bụ ọkaikpe iyi ọrụ n'Anambra steeti Gọvanọ Willie Obiano edoola nwaanyị mbụ bụ okeiwu n'iyi ọrọ. Okiwu ndị steeti Alaigbo ndị ọzọ bịara emume a pụrụ iche n'Obi gọọmentị nke steeti ahụ. Otu Super Falcons nke Naịjirịa ewerela ọkpụ anọ a satara atọ merie ogbo ha ndị Slovakịa na asọmpi Cyprus Women's Cup. Rita Chikwelu nyere goolu abụọ na ya bụ asọmpị . Mba Amerịka ekwuola na ha ga-enye onye ọbụla ga-enye ha ozi bara uru gbasara nwa Osama Bin Laden bụ Hamza, otu nde dọla. Ha kwuru na Hamza a na-enyo na ọ nọchiri anya nna ya dịka onyeisi otu Al-Qa'ida, na-ekwu ekwu iwakpo mba Amerịka na ndị enyi ha. Udo Naịjirịa Abdusalami Abubakar chịburu Naịjiria dịka onye agha, bishọp ndị ụka katọlik na Sokoto bụ Matthew Kukah na ndị ọzọ nọ n'otu kpọrọ onwe ha National Peace Committee, zutere Atiku Abubakar na Peter Obi zọrọ ọchịchị na ndị isi a hụrụ kwaba okpu nọ n'okpuru PDP, n'abalị Tọọzde. Na nzukọ ahụ, ndị otu ahụ na-ekpe udo gwara ndị PDP ka ha chefuo maka ịga ụlọikpe gbasara mpụtara ntuliaka a, mana PDP kwuru na ha ga-aga n'ihu makana ọ bụ ihe ọjọọ ma ha ghara ịgbagha ya maka ọdịniihu Naịjirịa. Ndị otu ""National Peace Committee"" a mechara gakwuru osote onyeisiala Yemi Osinbajo n'Aso Rock, ebe ha nọ nwee nzukọ gbasara ịhụ na udo dị site na ntuliaka a e mere Kingsley Moghalu ekwuola okwu Moghalu zọrọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati YPP, kwuru na o wutere ya na ntuliaka a tara isi ndị mmadụ. O kwukwara na ọnụọgụgụ ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec gụpụtara na ọ bụ vootu ole a tụnyeere ya, abụghị ole o kwesịrị inweta, makana o zughi ezu. N'egwuregwu, Fulham achụọla Claudio Ranieri n'ọrụ dịka onye nchịkọta ha ma tinye Scott Parker ka ọ nọchie ya ruo mgbe ha họtara onye ọzọ. Ọchụchụ ya na-abịa naanị ụbọchị narị na isii e wechara ya n'ọrụ. Gere akụkọ BBC na nkeji: Ihe nkiri taa:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-47392138 +politics Ministerial Screening: Ụfọdụ ihe ịrịbaama mere na nhọpụta ndị ọchịchị e mere n'ụlọomeiwu ukwu "Ihe mbụ gbagwojuru anya bụ na nwaanyị mbụ bịara ya bụ nnyocha bụ Sharon Ikeazor sị Anambra steeti enweghị ajụjụ ajụrụ ya. Kama ha sị ya gbuchapụrụ ndị omeiwu gawa maka ọ bụ nwaanyị n'ihi na ihe nwaanyị na-adị ha mma. Onye ọzọ kpara ụka ọchị ebe ahụ bụ Dede Rochas Okorocha bụ onye juru Olamilekan Adegbite nke Ogun steeti ihe ọ ga-eme ịweta obi aṅụrị na Naịjirịa ọkachasị ugbua obi aṅụrị kọrọ ụkọ n'ala a. Cheta na Rochas Okorocha hibere ministrị na ahụ maka obi aṅụrị mgbe ọ bụ gọvanọ Imo steeti. Ihe gbasara obi aṅụrị na-echu ya ụrọ. Nwaamadị ọzọ jụrụ ajụ atụghị anya ebe ahụ bụ Ewhrudjakpo Lawrence bụ onye juru sị ""ụgbụa gọọmenti etiti kwusigoro ịta akpụka anụ bụ kanda, bụ nke na enya ha obi aṅụrị, kedụ ụzọ ọ ga-esi wete obi aṅụrị n'ụlọ ndị mmadụ?"" Ndị mmadụ kwachakwara ọchị na ya bụ ajụjụ. Nke ọzọ bụ Enyinnaya Abaribe gwara Godswill Akpabio na-enwezụga na ha kwekọrịtara na onye bụbu onye otu ha ga-egbuchapụrụ ha na-azaghị ajụjụ ọbụla, na ya kara ịme ya ka ọ gbaa ọsịsọ. Ndị Sineti gwakwara Rotimi Amechi ankwa George Akume ha gbuchepụrụ ha gaa ihu na-azaghịa ajụjụ ọbụla. Akụkọ ga-amasị gị" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49109179 +entertainment "Angela Nwosu: ""Ihe mmadụ na-echere ndị ọzọ bụ ihe na-abịakute onye ahụ""" Onye ama ama na soshal bụ Angela Nwosu ekwuola na ụfọdụ ndị ihe na-esiri ike bụ maka na ha na-enwe obi ọjọọ mgbe ha hụrụ onye ihe ọma na-emere. Nwosu kwuru nke a na mkparịtaụka pụrụ iche ya na BBC Igbo nwere n'ọdị nso a. Ọ kọwara na-etu ihe ọma si abịara mmadụ bụ mgbe mmadụ na-enwe obi ọma maka ihe ọma meere ndị ọzọ, ma rịọọ ka Chukwu gozie ha. Gere ndụmọdụ ya n'uju n'ihe onyonyoo dị n'elu. N'igosi ihe onyoonyo a, abụghị na BBC kwenyere n'okwukwe ya maọbụ ahịa ọ na-ere. Vining Ogu na Chimezie Ucheagbo so ndị mere ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/media-53730202 +politics O nweghi onye ọbụla m tere mmanụ n'isi - Buhari "Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola gbowam na o nweghi onye ọbụla o tere mmanụ n’isi dịka onye ga-anọchite anya n’ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa. O kwuru nke a mgbe ya na ndị gọvanọ pati ya bụ APC nwere ọgbakọ n’ehihie Mọnde n’Abuja ma sị na e kwesịrị ịkwanyere pai ha ugwu. Ọ sị “O nweghi onye ọbụla m tere mmanụ n’isi n’ime ndị na-azọ ọkwa Onyeisiala n’aha APC, e nweghi onye nke kacha amasị m, o nweghi onye m na-amagide ka a họpụta ya. Buhari gwara sị na obi dị ya ọcha banyere nke ahụ ma gwa ndị Gọvanọ APC ka ha mee etu ahụ. “A họpụtara unu dịka e ji họpụta m, hapụ nụ ka ndị pati mee ntuliaka ma họpụta onye ha chọrọ, O nweghi onye ga-ete onye ọbụla mmanụ”. Nke a na-abịa dịka Gọvanọ ndị si mpaghara Ugwu kpebiri ma kwechiri na e si na mpaghara Ndịda họpụta onye ga-azọ ọkwa a. Ha rịọkwara Onyeisiala mgbaghara maka etu akwụkwọ nkwekọrịta ha jiri gbaa n’anwụ. Ọtụtụ ndị nkwado otu pati All Progressives Congress (APC), ndị ntaakụkọ na ndị ọzọ ọrụ banyere ntuliaka dịịrị na-agbakọta n'ama sara mbara nke Eagles Square, Abuja maka ntuliaka ime ụlọ otu pati ahụ. APC hibere ntuliaka ime ụlọ ha taa bụ Mọnde ụbọchị isii nke ọnwa Juun, 2022, a na-atụ anya na ya bụ ntuliaka ga-amalite n'ebe mgbede. Cheta na pati ehigharịala ntuliaka aka ugboro ugboro tupu ụlọọrụ Inec ehibe izu mbụ n'ọnwa Juun ka ọ bụrụ ohere ikpeazụ ha. Iji kwado onwe ha, ndị isi otu patị APC banyere nzukọ imeụlọ iji hazie ihe olemaole na ya bụ oru ndọrọndorọ ọchichi n'ụbọchị ụka. Dịka o siri dị, ndị ntaakụkọ na ọtụtụ ndị nchekwa juputara ebe ahụ n'ụbọchị Sọnde iji chekwaa ma gbaa aka ebe ihe na-eme ebe ahụ. Ndị gọvanọ APC niile sonyekwara ya bụ nzukọ, a na-atụanya na ha ga-ehiwe nzukọ dị iche iche maka nghopụta ime ụlo pati ha na-akwado. Akụkọ ka na-abịa Ihe ise a na-atụ anya ya na ntuliaka ime ụlọ APC Ọtụtụ ndị Naịjiria eburula oche nọrọ ala na-eche dịka ndị pati All Progressives Congress (APC) na-akwado ime ntuliaka ime ụlọ nke ha ga-eji họpụta onye ga-efe ọkọlọtọ ha dịka onyeisiala Naịjiria n'afọ 2023. Dịka APC si kwuo, ya bụ ntuliaka ga-eme n'Abuja, isiobodo Naịjiria, site n'ụbọchị isii ruo asatọ nke ọnwa Juun afọ 2022. Dịka a na-akwado ya bụ emume, ụfọdụ na-atụ anya ụfọdụ ihe ndị pụtara okwu n'ime isu a, na-agba anya ka tọọchị ịmata ihe ga-eme na ya bụ ọgbakọ - ọkachasị etu a Onyeisiala Muhammadu Buhari gwara ndị na-azọ ọkwa ka ha gbaa izu n'ime onwe ha ma họpụta onye kpọrọ akpọ, kajara akaja ga-abụ onye ga-efere ha ọkọlọtọ pati ahụ na ya bụ ntuliaka. 1) Atụmvootu iji mara onye ga-efe ọkọlọtọ APC: Ka ọ dị ugbua, ihe karịrị mmadụ iri abụọ kwụrụ nde otu narị naịra (N100m) iji zụta akwụkwọ mmasị iso zọọ ọkwa onyeisiala n'okpuru APC, mana ọ bụ naanị otu onye ka isi ya ga-apụta mgbe a ga-apịachi ntuliaka a. Ndị nnọchiteanya a họpụtara na steeti niile dị na Naịjiria (Bekee kpọrọ delegates) ga-atụrụ mmadụ 23 ahụ (bụ ndị otu nnyocha APC nyochara) vootu iji mara onye vootu ya ga-akarịcha. Ha niile ga-achị obi ha n'aka, mana ọ bụ naanị onye vootu ya kacha nnukwu ga-abụ onye ga-azọnwu ọkwa onyeisiala Naịjiria n'afọ 2023, n'okpuru pati APC. 2) Nchọpụta ma ọchịchị ọ ga-eru onye Ndịda aka na pati ahụ: N'akwụkwọ ozi ndị gọvanọ ndị Ugwu nọ na pati APC binyere aka nso nso a, ha kwuru na ha na-akwado atụmatụ onye si Ndịda Naịjiria ịchị Naịjiria n'afọ 2023. Ndị gọvanọ ahụ dị mmadụ 11 kwuru na ha agwala ndị Ugwu niile na-azo ọkwa ahụ ka ha gbalịa wụsa ọwa ngwa ngwa. Ha kwuru na ọ bụ n'ihi na onye si mpaghara Ugwu (Onyeisiala Muhammadu Buhari) achịala afọ asatọ, mere ha ji kwere na ọ ga-adị mma ka ndị Ndịda chịa. Mana nke a ọ ga-abịa na mmezu? Echi ka anyị ga-amata. 3) A chụpụrụ ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa n'ezie? Akụkọ pụtara dịka kepukepu n'izu a na ụfọdụ ndị agaghị esonyezi na ntuliaka ime ụlọ APC dịka nnyocha e mere ha gosiri na ha etozughi. Kepu kepu ahụ kwuru na ọ bụ John Odigie-Oyegun - bụ onyeisi otu nnyocha ndị na-azọ ọkwa n'APC - gwara ndị ntaakụkọ na o sila na 23 budata ọnụọgụgụ ndị ga-eso azọ ọkwa onyeisiala ruo 13. Mana nke a o mere eme ka ọ bụ akụkọ ụgha? N'ụbọchị ntuliaka imeụlọ kpọmkwem ka ndị na-eche ga-amata n'ihi na ndị Igbo na-ekwu na ekwe kụọ, ama agbaa. 4) Naanị otu nwaanyị so azọ ọkwa onyeisiala n'APC N'ime aha mmadụ 23 kwupụtara mmasị ha iso zọọ ọkwa onyeisiala n'okpuru APC, naanị otu mkpụrụ nwaanyị so ya; aha ya bụ Uju Ken-Ohanenye - onye Awka, n'Anambra steeti. Dịka o si akpọ onwe ya, Uju bụ onye ọkaiwu kwuru na ọ bụ ""mmanya ọhụrụ nọ n'ime karama ọhụrụ"". 5) Onye kacha pee mpe n'afọ na ndị so azọ ọkwa a? N'ime mmadụ 23 a so azọ ọkwa a, Felix Nicholas bụ ụkọchukwu ụlọụka Miracle Center International na mba Amerịka, bụ onye kacha pee mpe n'afọ. Nicholas dị afọ iri anọ (40), zọburu ọkwa onyeisiala n'afọ 2019 n'okpuru Peoples Coalition Party (PCP). Ndị ọzọ dị ebe afọ site 40 ruo 73 (Ken Nnamani na Robert Ajayi Boroffice bụ ndị nke dị afọ 73). Ewezuga ihe ise a, kedụ ihe ndị ọzọ ị na-atụ anya ya na ntuliaka imeụlọ APC ga-eme?" https://www.bbc.com/igbo/articles/cy6n3z8g92no +health Physiotherapy: Onye nwere nkwarụ na-agba ọkpụkpụ Remigius Anaiagbaoso bụ onye nwere nkwaru na nwata site n'ọgwụ agbara ya. Ihe kacha ewute ya abụghị nkwarụ ọ nwere site na ya bụ ogwụ agbara ya, ka ọ bụ mkpu ndị ọzọ na-eti mgbe nwaanye ya nwaanyị na-agba ha ọkpụkpụ. Nke a mere Remigius jiri gaa mahadum ga mụta ka esi agba ọkpụkpụ nke Bekee kpọrọ Physiotherapy. Kemgbe ahụ Remigius meghere ụlọọrụ ebe ọ na-agba ndị mmadụ ọkpụkpụ ma nwekwa ezi na ụlọ bụ ndị ọ na-elọkata anya. Ndị mere akụkọ a bu Chris Okereke na Chiemela Mgbeahụrụ https://www.bbc.com/igbo/afirika-51655773 +sports Juventus vs Ajax: C Ronaldo abụrụla 'Erọn gba aka' Ajax a na-ele anya ka 'obere mmadụ' ebe Juventus nọ agbaalara ha ụgbọ nwamkpi. Ọkpụ goolu Donny van de Beek ji gbakaa neetị na nkeji 34 na nke Matthijs de Ligt ji isi takpuo na nkeji 67 zuru ịkpọ Juventus ntu n'obi. Na Cristiano Ronaldo maburula iko a ugboro ise bu ụzọ nye goolu na nkeji 28, akwụsịghị ihe mgbu ndị Juventus maọlị. A sị na Juventus gbalịrị inye goolu abụọ, egwu a gaara abụ kpọkịrịkpọ makana ha gaara enweta oghere iji zọọ isi onwe ha, mara ma ha a ga-agafe banye agba ọkara-ikpeazụ. Ajax ga-ezute onye meriri n'etiti Manchester City na Tottenham. Cheta na Tottenham ji otu ọkpụ goolu emeri Man City. Omotola Jalade na Bashir Ahmad na-akwata ya: Nwaada ji ihe onyonyo eri bụ Omotola Jalade-Ekeinde dere n'akara twitter ya ụnyahụ sị na Naịjirịa bụ ọkụmmụọ. Na nzahachị ya onye nnyemaka pụrụiche na mgbasa ozi Onyeisiala Mohammadu Buhari zahachiri ya na okwesighi ikwu otu ahụ maka na ndị ji ọrụ anaghị ekwu okwu. Ụlọomeiwu n'Imo steeti akpọchitela ndị otu ha achụpụrụ achụpụ maka ịda iwu ụlọomeiwu ụlọopmeiwu n'Ọktoba 2018. Onye ndu ndị ụlọemeiwu ahụ bụ Acho Ihim nabatara mmadụ ise ndị ahụ n'ọgbakọ ha nwere tata bụ Tuzde ụbọchị iri na isii n'Apreel, 2019. Ndị gunyere na ndị a nabatara bụ Chiji Collins (si n'Isiala Mbano), Uche Oguwuike (nke Ikeduru), Ifeanyi Nnataraonye (Mbaitoli), Donatus Onuigwe (Oru West), na kenna Nzeruo (nke Oru West). Ụgbooloko gburu mmadụ na Kano Akụkọ na-erụ anyị na-ekwu na ụgbọoloko akwọpịala mmadụ abụọ ha amabeghi ndị ha bụ na Kano. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Abdullahi Harunana Kano steeti gwara ndị ntaakụkọ na mmadụ abụọ ndịa dinara n'okporo ụzọ ụgbọ nke dị n'azụ Kano Club, dịka ha nwetere ya bụ ozi n'ụtụtụ taa bụ Tuzde. N'ofesi, ọtụtụ mmadụ ọkụ gbara ụlọ ụka Notre Dame wutekarịrị ekwela nkwa nde kwuru nde Euro maka iruzi ụlọụka ndị Fada bụ Notre-Dame na France. Amatabeghi ihe bidoro ya bụ ọkụ gbara ụlọụka ruru afọ narị asatọ na iri ise (850 year). Man. U na Barcelona N'egwuruegwu, ndị nkwado Barcelona na Manchester United ekeela nkwucha maka ịnabata ndị otu ha na Champions league n'abalị a. Ha ga-akwarịta mpi na Camp Nou n'elekere asatọ nke abalị tata. Ọ bụ taa ka ngalaba na-elekọta ntụliaka na Naịjirịa nyere Nyesom Wike asambodo mmeri ya. Nyesome Wike zọr��� ọkwa gọvanọ n'okpuru otu PDP meriri na Rivas steeti n'agbanyeghị ọgụ na mgba na ọgbaghara dapụtara. E megharịrị ntuliaka ahụ meburu n'ụbọchị 9 nke ọnwa maachị mgbe a hụrụ na mpụ na nrụrụaka na-arị ibe ya elu. Ọ bụkwa na ntuliaka ahụ ka Inec na ndị ọzọ boro ndịagha Naịjirịa ebubo na ha gbochri ntuliaka ị gaa ọfụma na Rivas steeti. Kọmịsọna na-ahụ maka azụmahịa Christain Madubuko kọwara na gọọmentị Anambra nwụchiri mmadu atọ na steeti ahụ. O kwuru na ndị a, nke otu n'ime ha a bụ eze, ji aghụghọ anapụ ndị mmadụ ego ụtụ isi n'ahịa. Madubuko dọkwara ndị mmadụ aka na ntị ha hie asaa na anya gbasara onye ha na-akwụ ụtụ isi ma kwukwa na ọ bụ sọsọ gọọmentị nwere ikike ihibe ahịa. Otu oyi egwu eji Islamic State mara ekwuola na ha gburu ndị agha iri abụọ na atọ na Naịjirịa ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Epreelụ. IS si na ọ bụ ogbunigwe ebu n'ụgbọala ka ha jiri kpa ike a n'obodo Tumbum dị na Borno. Ndị agha Naịjirịa etinyebeghi ọnụ na ya bụ okwu. Ọgbakọ mba Afrịka bụ African Union sị na ha chọrọ ka ndị nkịtị were ọchịchị na mba Sudan. Otu AU si ndị agha ji ọchịchi na mba ahụ mee ngwa ngwa kagbuo atụmatụ ha iwezuga iwu ji obodo ahụ. Goolu Aubameyang nyere bụ ihe eji gụọ ọjị mgbe Arsenal zutere Watford ụnyaahụ. Watford dị mmadụ iri gbacha asọmpị ahụ ka onye ndu ha bụ Troy Deeney natara akwụkwọ ọbara ọbara https://www.bbc.com/igbo/afirika-47944816 +health World AIDS Day: 'A rịala m ọrịa HIV/AIDS ruo afọ anọ ka kwụrụ chim' "Ụbọchị December 1 nke afọ ọbụla bụ nke ngalaba ahụike mba ụwa ji eme ncheta agha a na-ebuso HIV gụnyere mgbochi ya, nyocha ya, nlekọta ọgwụgwọ ya, dgz. Dịka ngalaba World Health Organisation si depụta, ncheta nke afọ 2020 na-ebu aka maka mkpa mkpa covid na-akpa na mba ụwa niile mana a na-aja ndị nọ n'ihu agha a ike. Otu onye rịagoro ọrịa site n'afọ 2014 ruo afọ 2018 gwara BBC ka o si were ọnọdụ a na-enyere ndị mmadụ aka site n'ịgwa ha okwu nkasiobi nakwa ihe ha ga-eji ndụ ha mee n'ọnọdụ di etu ahụ. O kwukwara na mgbe ọ chopụtara na ọ na-arịa ọrịa a, ọ maghị ka ọ ga-esi gwa nne na nna ya. Gere ihe o kwuru n'uju n'ihe nkiri a. Isiokwu #WorldAIDSDay nke afọ 2018 bụ ""mara ọnọdụ gị"". Ọtụtụ ngalaba ahụike mbaụwa ekwuola obi ha gbasara ncheta ụbọchị HIV/AIDS. Otu n'ime ha bụ World Health Organisation. Ha kwuru na otu onye n'ime mmadụ anọ ọbụla na mbaụwa niile nwere ọrịa HIV/AIDS mana ha amaghị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-46410604 +politics Chukwuma Soludo News: Charlie nwa Mgbaafọ emeriela ntuliaka Anambra "Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo ji ọkọlọtọ All Progressive Grand Alliance a na-akpọ Apga emeriela ntuliaka ịbụ gọvanọ Anambra dịka mpụtara ntuliaka gbara n'ụbọchị Wenezde Novemba 10, 2021. Soludo kacha nwe vootu na mmadụ 18 ndị soro zọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti. Ọkammụta Florence Obi (bụ returning officer) ndị nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission bụ Inec n'ichafu kpọpụtara ya dịka onye mmeri. Ọkammụta Soludo chịtara vootu 112,229 n'ime vootu 249,631 niile a tụrụ n'Anambra. Onye sotere ya na ntuliaka e mere n'Anambra bụ Maazị Valentine Ozigbo chịtara vootu 53,807 n'ime vootu a tụrụ n'Anambra steeti. Ọ ga-eru Maachị 2022 tupu ọkammụta Chukwuma Charles Soludo ga-aṅụ iyi ọrụ tupu ọ chịwa Anambra dịka gọvanọ. Ndị otu pati All Progressives Congress (APC) nọ n'ụlọọrụ Inec ebe a kpọpụtara mpụtara ntuliaka ebinyeghị aka n'akwụkwọ e ji ekweta maka mpụtara ntuliaka. Cheta na n'ụbọchị Sọnde 7 Nọvemba, 2022 ka ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naijiria bụ Independent National Electoral Commission (Inec) akpọpụtaghizi onye ga-achị Anambra dịka gọvanọ n'ụbọchị kaa ọha si chee. 'Returning officer' nke Inec n'okwu ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra bụ Ọkamụta Florence Obi n'abali Sọnde kwuru na Inec emeghi mkpebi maka onye mmeriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra dịka ọha nọ chere mpụtara ntuliaka ruo ime abalị ụbọchị ahụ. Florence Obi kọwara na nke a bụ maka na emeghi ntuliaka n'otu okpuruọchịchị n'Anambra steeti n'ihi nsogbu ọgbaghara. Ya mere na n'ime okpuruọchịchị iri abụọ na otu bụ okpuruọchịchị Ihiala. Inec ekwuola na dịka nke a mere na a ga-eme ntuliaka mgbakwunye bụ nke Beekee kpọrọ 'Supplimentary Election' ebe ahụ n'ụbọchị Tuzde 9 Novemba 2021. Site n'okwu ndị ụlọorụ Inec, ihe gbochiri ntuliaka ebe abụ bụ okwu ajọ ụzọ nakwa okwu nsogbu ezi nchekwa. Cheta na site n'akwụkwọ ndị ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka Naịjirịa bụ Inec bipụtara, ha sị na mmadụ 148,000 debanyere aha ha ịtụ vootu n'okpuruọchịchị Ihiala. Ma na n'oge gara aga mgbe ndị na-azọ okwa gọvanọ mere achụmnta vootu n'Ihiala, ndị omekome mere nwakpoo ebe ahụ nke mere ndị ọrụ nchekwa ji memina mmadụ anọ n'ime ha. Ndị na-achọ nwereonwe Biafra foro ntututaa sị na agaghị eme ntuliaka n'Anambra, mere ezigbo nsogbu nchekwa wee dịrị n'oge ahụ. Ya mere n'ihi iji chekwa ndụ ha, ndị mmadụ apụtaghi ịtụ vootu ha. Ajụjụ juru ndị mmadụ n'ọnụ ugbua bụ nke a ọ ga-emetụta onye ga-enwete mmeri na ntuliaka a ka ọ gaghi? Dịka o si aga, Returning Officer ndị ụlọọrụ Inec bụ onye na-ewega mpụtara ntuliaka e mere kwupụtara na o nweghị ntuliaka e mere n'Ihiala n'ụbọchị 6 Nọvemba. Cheta na ụlọọrụ Independent National Electoral Commission, INEC amalitela nchịkọta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti n'ogogo steeti n'ụtụtụ Sọnde 7 Nọvemba n'ụfọdụ mpaghara okpuruọchịchị Ihiala dịka a malitere ịchịkọta nke wọọdụ na okpuru ọchịchị n'ụbọchị Satọde. Nke a na-abịa dịka Inec dọtịkwuru oge ntuliaka ruo taa bụ Sọnde iji nye ndị igwe ndenye aha BVAS (nke Inec ji arụ ọrụ) ekweghi mee ntuliaka ụnyaahụ, ohere ịtụ vootu. Dịka Inec si depụta, ihe ọ na-ewe iji kpọpụta mpụtara onye meriri na ntuliaka onyeisiala maọbụ nke gọvano bụ onye a kachasị tunyere vootu. Ya a pụtara na onye ahụ ga-emeriri otu ụzọ n'ụzo anọ ndị niile a turu vootu n'ụzọ abụo n'ime ụzọ atọ nke steeti niile dị na Naịjirịa maọbụ okpuruọchịchị dị na steeti. Ebe a ka ị ga-ahụ mpụtara vootu niile a tụrụ n'Anambra steeti, nke Bekee kpọrọ ""Anambra election update"". Nsogbu dapụtara n'Orumba Nọọtụ Chief ""returning officer"" ndị Inec nke Orumba Noọtụ bụ dkt Michael Otu ekwuola na amanyere ya amanye ibianye aka n'akwụkwọ e ji agụkọ vootu. Ọkammụta Florence Obi bụ 'electoral officer' nke Anambra gwara ya kọwatụ ihe merenụ. O kwuru na ndị omekome nakwa ndị uweojii kụrụ ya na osote ya ihe tịnka kụrụ pan n'oge ntụliaka ahụ mere na Nov 7,2021. Obi gwara ọkammụta Otu ka o gaa depụta mkpesa ahụ n'akwụkwọ. Charles Chukwuma Soludo bụ onye Isuofia, n'okpuruọchịchị Agụata Anambra steeti. O tokwara n'Anambra steeti, ya mere ya na ndị ma ya ji akpọ ya 'ọkụkọ Igbo'. Soludo dị afọ 61 na nwunye ya bụ Nonye Soludo, mụrụ ụmụ isii. Ọ bụ onye nkuzi na mahadum tupu ọ bụrụ onyeisi ụlọọrụ Central Bank of Nigeria, site na 2004 ruo 2009. Ọ bụghị mbụ ọ na-apụta ịzọ ọkwa gọvanọ dịka ọ nwara n'afọ 2010 n'okpuru otu patị ndọrọndọrọ People's Democratic Party a ma ka PDP, mana Peter Obi meriri ya. Ọ nwakwara n'afọ 2013 n'okpuru APGA, mana ndị nnyocha otu pati ahụ kwuru na o tozughi." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59196110 +sports Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Cardiff city abaala Premier Lig Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a: Egburu ọchụ na Birnin Gwari ọzọ. Ndị nche obodo na ndịagha Naịjirịa ebupula ozu ruru iri anọ na ise n'obodo Gwaska ebe ndị omekome wakporo Birnin-Gwari ọzọ. Agbakwara ụfọdụ ụlọ obibi ọkụ ma na-atụ egwu na a ga-achọta ozu ndị ọzọ n'ọhịa. Ebe ọzọ na Naịjirịa. Ihe iru uju emetụtala ndị uweojii ka mmadụ ise ndị uweojii nọ n'ọzụzụ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ. Mmadụ ise a nwụrụ ka ụgbọala ha ji eme njem nwuuru ọkụ n'okporoụzọ Kano-Zaria ka ha nọ na-alaghachi ebe obibi ha. Akụkọ kwuru na ha chọrọ ịlaru ụlọ maka ọbere ezumike ha nwetara n'ụlọakwụkwọ tupu ihe mberede a emee. Na Mba ofesi, Ide mmiri sitere n'oke mmiriozuzo emerụọla mmadụ isii ahụ na mba Turkey. Ide a burukwara ụfọdụ ụgbọala ma mebie ọdọ ahịa dị icheiche n'isi obodo Turkey bụ Ankara. Enweghị onye nwụrụ n'ime ide a. N'Egwuregwu, Ka a na-ahazi ọkwa Premier League maka imechi asọmpị ahụ, ka a na-ahụkwa ndị mmeri na ndị emeriri. Cardiff City esonyela na ndị a ga-ebuba n'ọkwa Premier League ugbua, ebe otu bọọlụ Birmingham meriri Fulham Gee nkeji anyị na mgbede a: https://www.bbc.com/igbo/afirika-44024242 +politics Ipob: Nnamdi Kanu ga-abata mgbe Naịjirịa dị njikere Paul Achalla bụ ọkaiwu Ipob akọwala etu ihe si kwụrụ ugbua n'akụkụ Nnamdi Kanu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48766051 +politics Minimum Wage: Ọ bụrụ na Gọọmentị daara anyị, anyị adaara ha - Odeakwụkwọ NLC "Emmanuel Ugboaja bụ odeakwụkwọ ukwu otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC), ekwuola ihe gọọmentị ga-eme ka ndị ọrụ ghara ịgba abụbụọrụ. O sị na atụmatụ ha chọrọ iji akwụ ndị ọrụ ụgwọ opekatampe adịghị mma maka na ọ ga-emegbu ndị ọrụ ogogo ha dị elu. O kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị welite aka na pasentị ego ole ha chọrọ ịkwụ, na ha bụ ndịisi ọrụ ga-ewetu aka ha ala iji mee ka ha nwee nkwekọrịta. N'okwu ya ""Mkparịtaụka dịka egwuregwu nkịta, ị daara m, m adaara gị. Ọ bụrụ na gọọmentị welite aka elu, anyị ga-anabata ihe ha kwuru."" Ndị otu a na-achọ ka e tinyere ha pesentị iri abụọ na itoolu (29%) n'ego a na-akwụ ndị ọrụ nọ n'ogogo asaa ruo ogogo iri na anọ. Ebe a ga-etinye pasentị iri abụọ na anọ na nke ndị ọrụ n'ogogo iri na ise ruo ogogo iri na asaa. Mana onyeisi otu jikọtara ndị gọvanọ bụ Kayode Fayemi, ekwuola na ndị gọvanọ agaghị akwụli ụdị ego ahụ. A na-atụ anya na gọọmentị na ndị NLC ga-enwe mkparịtaụka na Tuzde 15 Ọktoba, 2019. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50038691 +health Fertility Checks: Ajụjụ dị oke mkpa i kwesiri ịjụ onye nke gị tupu unu alụọ "Alụmdi na nwunye abụghị egwu achị ụtaba n'aka agba. O kwesịrị na ndị ọ dị n'obi ịlụ ga-ajụ ajụjụ dị mkpa banyere ahụike ha, ọkachasị ọnọdụ ịmụta nwa tupu ha alụwa. Lee ụfọdụ ese dị mkpa na nwoke na nwaanyị ga-ajụ banyere onwe ha tupu ha biri ka nwaanyị na di: 1. Ị riaala ọrịa nsina mmekọ mbụ? Ọrịa nsina mmekọ nke Bekee kpọrọ ""Sexually transmitted Infections"" bụ ọrịa na-emebi akpa amụ maọbụ akpa akwa (gonads) ma ọ bụrụ na a gwọghị ya n'oge. Dọkịta Ayodeji Oluwole nke Lagọs University Teaching Hospital kwuru na ""ọ bụrụ na agwọghị ọrịa 'Gonorrhea', 'Syphilis,' 'Chlamydia', 'Hepatitis B', n'oge maọbụ na-agwọghị ya ọfụma, ha nwere ike imebi akụkụ ahụ metụtara ọmụmụ nwa."" Nghọta ụfọdụ bụ na ọ bụ naanị nwaanyị na-agba 'alabanko' na-emebi ihe e ji amụ nwa n'ihi ọrịa so inwe mmekọrịta, mana ka ọ dị be oke ka ọ dị be ọgịnị. Idina onye ọbụla na-enweghị mgbochi nwere ike imetụ nwoke n'ihi na ọrịa nsina mmekọ taa akụ n'ime ahụ nwoke, o nwere ike ime ịmetụ mmiri amụ maọbụ mee ka mkpụrụ nwa ghara ịdị n'ime ya (azospermia) . Cheta na ihe mere ụfọdụ ime ji apụ nwaanyị bụ n'ihi na mkpụrụ nwa si na-ahụ nke nwoke ejighị ahụ. 2. Gịnị bụ 'blood group' gị? E nwere otu ọbara anọ, Otu 'A', otu 'B', otu AB na otu 'O'. Ndị ọkachamara na-ekwu na ọ bụrụ na nwaanyị nwere Rhesus- negative (Rh−) lụọ nwoke nwere 'Rhesus- positive' (Rh+) dị ime mbụ ya ọ bụrụ 'Rhesus- positive' (Rh+), o nwere ike isi n'alọ (placenta) banye n'ọbara nwa ọzọ butere ya ọrịa a kpọrọ ""rhesus Disease"". Dkta Joseph Akinde, onye nwe ụlọọgwụ Livingspring Hospital, Ejigbo, Legọs kọwara na ""nke nwere ike ime ka ime pụọ nwaanyị, maọbụ a mụọ nwa ahụ ọ nwụọ, maọbụ o nwee ọrịa obi, maọbụ nke ụbụrụ, maọbụ nwa ahụ enwe ọrụsị."" Ọ bụghị na nwaanyị nwere 'Rhesus- negative' agaghị alụ di, kama ọ dị mkpa ịmata nke a n'oge iji gbochie ọdachi amaghị ama. A na-agba nwaanyị nwere ya ọgwụ awa 72 o ji mụcha nwa iji mebie nke Bekee kpọrọ ""Rhesus-positive cells"" si n'ahụ nwa ọhụrụ banye ya n'ahụ. Nwaanyị mụrụla nwa mbụ maọbụ nke terela ime mbụ nwere ike inwe nsogbu a. 3. Nke nwaanyị ọ tụọla ime mbụ? O teela ime mbụ? Nke a dị nnukwu mkpa n'ihi na dịka dọkịta akụ ike ụmụnwaanyị bụ Ngọzị Obi siri kọwa ọ bụrụ na ọ tụọla ime mbụ ya bụ na o nwere ike ịtụ ọzọ. Obi kwukwara na ọ bụụ na oteela ime mbụ, o nwere ike ibute nsogbu ga-eme ịtụ ime ọzọ ahịa ahụ. Ndị ọkachamara na-ekwu na ite ime nwere ike ime ka ọcha dị nwaanyị n'akpa nwa nke nwere ike ibute ọgbachị na 'fallopian tube' nke nwereike ime ka ọ ghara ịtụnwụ ime. Oke ite ime nwekwara ike ibute akpanwa enwenwughị ike ijidenwu nwa nke Bekee na-akpọ 'cervical incompetence'. 'Cervical incompetence' dịka ka ndị ọkammụta siri kọwaa, na-eme ka ime na-apụ ụfọdụ nwaanyị. 4. O nwere ọrịa ala ala? Ọrịa ala ala dịka varicocele , prostatis-ọrịa na-emetụta agede (prostate) - na ọrịa shuga nwere ike ime ka o sie ike nwoke ịtụwali nwaanyị ya ime. N'ụmụnwaanyị, ọrịa ala ala dịka ""endometriosis"" nwere ike ibute amụtaghị nwa, ebe ọrịa shuga nwere ike inye nwaanyị nsogbu n'afọ ime.' O nweela atụmatụ igbochị ịmụ nwa imerela na mbụ? Ajụjụ a dị mkpa n'ihi na atụmatụ ọbụla nwere ihe so ya nke nwere ike imetụta ịmụ nwa. Ụmụ ole ka ụnụ ga-amụ? Nwoke ole, nwaanyị ole? so na-ajụjụ dị mkpa ụnụ kwesịrị ịjụ ma saa onwe ụnụ. 5. Kedụ oge i bidoro hụwa nsọ gị? Oge nwaanyị bidoro hụwa nsọ ya maọbụ ụgboro ole ọ na-ahụ ya n'afọ (ọ dị 'regular' ka ọ dị 'irregular'), nwere ike ịrụtụ aka otu ọnọdụ ọmụmụ nwaanyị. Dr Joseph Akinde kọwara na ime nwere ike siere nwaanyị na-ahụ nso ya naanị ugboro abụọ maọbụ atọ n'afọ ike. 6. Kedụ mgbe o ji enwe 'ovulation' ya Nwoke ịma ma onye nke ya ọ na-ama oge ọ nọ n'izi (ovulation) n'ihi na ọ bụrụ na ọ naghị anọ n'izi, ị mara na ọ ga-enwe nsogbụ ịmụ nwa. Dọkịta Obi sị,""Ihe ọ pụtara na ya bụ nwaanyị anaghị eyi akwa. Mkpa ọzọ ọ dị dịka ndị ọkachamara siri kọwaa bụ na ọ ga-enyere ha abụọ aka ịmata oge ha ga-anọkọ ime achapuo nakwa oge ha kwesịrị ịnọrọ onwe ha ma ọ bụrụ na ha achọghị nwa. 7. Gịnị bụ 'Genotype' gị? Ọ bụ 'A', 'AS' ka ọ bụ 'SS'? Onye nwere ọbara otu 'A' nwere ike ịlụ onye masirị ya, asịrị agaghị ịba ya. Mana onye nwere AS lụọ onye nwere AS ha nwere ohere pasentị 25 ịmụta nwa nwere ọrịa 'sickle cell.' Dọkịta Akinde kwuru na ị mata nke ị bụ ga-enyere gị aka ịgbalahụ ịmụ nwa nwere sickle cell anaemia. Ọ gara n'ihu kwuo,""ilekọta nwa nwere sicjkle cell adịghịghị mfe. Ọ na-erikwa ego."" O kwesịrị ka ndị chọro ịlụ onwe ha mee nnyocha ọbara iji mata ma ha enwere nje ọrịa HIV. Cheta na HIV bụ ọrịa a na-eke site na mmekọ, iji ihe dị nkọ onye bu ya bụ nje jiri mee ihe. Nnyocha ndị ọzọ dị mkpa gụnyere innyocha ahụike mkpụrụ nwa(sperm) nke Bekee kpọrọ 'seminal analysis'. Nchọpụta sayensi na-egosi na ụmụnwoke nwere mụmp oge ha dị na nwata na-enwe nsogbu ịtụwali nwaanyị ime ma ha tozuo dimkpa. 'Mump' bụ ọrịa na-emetụta akụkụ ahụ na-emepụta asọmmiri nke na-ebute akwakanti(nti ịza aza) nke a na-ekute n'asọmmiri onye bu ya.. Ụlọọgwụ Mayo Clinic rụtụrụ aka na 'mump' nwere ike ibute ntị ochichi, ọrịa obi, ime ipụ maọbụ bute mee mkpụụ amụ nwoke ịzawa aza ma otoruo okoro bịa Ọ dị mkpa ịmata na mmadụ nwere ike izu oke, na enweghị ọrịa ọbụla maọbụ nkwarụ ọbụla mana ha lụọ onwe ha, ime e sierie ha ike. Nke a ka Bekee na-akpọ 'unexplained infertility' nke bụ ime isi ike amaghị ihe butere ya.' Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51945740 +sports Luis Enrique na-eru ụjụ maka ọnwụ ada ya "Obi mgbawa na arịrị juru onye bụbu onye nchịtọka otu egwu bọọlụ mba Spen bụ Luis Enrique obi ugbua. Nke a bụ dịka ọ na-eru ụjụ maka ọnwụ nwa ya nwaanyị bụ Xana onye nwụrụ site n'ọrịa kansa ka ọ gbachara afọ itoolu. Enrique bụ onye wepụtara ozi maka ọnwụ nwa ya na Twitter na mgbede Tọzde dịka ọ na-ekele ndị ụlọọgwụ nyere aka lekọta nwa n'ọnwa ise ikpeazụ ya. O kwuru na nwata ahụ ga-abụ ""kpakpando ga-ana atụziri ezinaụlọ anyị."" Enrique kelekwara ndị mmadụ maka nkwado ha. Ka ọdị ugbua, otu dị icheiche etiela Enrique aka n'obi maka ọdachi a dakwasara ezinaụlọ ya. Ha gụnyere UEfa, Manchester United, Laliga wdg." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49525291 +politics Shettima, Lai Mohammed, Okonjo-Iweala na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ekike ha wuru ewu na soshal midia Kamgbe foto Kashim Shettima pụtachara dịka ọ gara ọgbakọ ndị 'Nigeria Bar Association' n'ụbọchị Mọnde, Ọgọst 22, 2022, ndị mmadụ na soshal midia aṅụbeghị mmiri tọgbọ iko. Ọtụtụ ewepụtela foto ebe ha kere ekike dịka nke Shettima; ụfọdụ mere nke a n'ụdị ihe ịkpa ọchị, ebe ndị ọzọ mere ya dịka nkwado. Nke a abụghị nke mbụ ekike onye ndọrọndọrọ ọchịchị na-akpalite akụkọ wuru ewu na soshal midia. Lee ụfọdụ ndị a ma ama ekike ha wurula ewu: Nke a bụ nke na-ewu ugbua na soshal midia. Kashim Shettima bụ aka chịburu Borno steeti, ma bụrụkwa onye na-azọ ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa na party 'All Progressives Congress'. Ndị dịka Festus Keyamo, bụ Mịnịsta nta na-ahụ maka ndị ọrụ na Naịjirịa, nakwa otiegwu Charles Oputa, onye e ji Charly Boy mara, ewepụtela foto ebe ha kere ekike dịka Shettima. Foto ekike Onyeisiala Muhammadu Buhari wukwara ewu na soshal midia oge ọ gara njem nleta n'Imo steeti n'afọ 2021. Na foto ahụ, Buhari yi akwa Isi Agu ma yirikwa traụza nke ọ dịka ọnụ ụkwụ ya anaghị erucha ala. Dịka foto ahụ pụtachara, ọtụtụ mmadụ, ọ kachasị ndị ọkpa ọchị yikwara ụdị uwe ahụ n'ụzọ iji kpaa ọchị. Ngozi Okonjo-iweala bụ onyeisi otu na-ahụ maka ịtụ mgbere ahịa n'ụwa niile nke a kpọrọ 'World Trade Organisation'. Nwa ada a arụbuola ọrụ ugboro abụọ dịka mịnịsa na-ahụ maka akụnaụba Naịjirịa. N'ọnwa Febrụwarị afọ 2021, dịka Okonjo-Iweala merichara ntuliaka dịka onyeisi WTO, ọtụtụ ụmụnwaanyị na Naịjirịa malitere ihe ha kpọrọ #BeLikeNgoziChallenge. Ha bidoro ike ekike dịka Ngozi Okonjo-Iweala iji gosi ịhụnanya ha nwere n'ebe nwaanyị a nọ nakwa iji too ya maka aha ọma ọ na-ewetara Naịjirịa. Nke a mere n'ọnwa Febrụwarị afọ 2018 oge Mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Mohammed gara njem nleta na mba Spen. Foto fesara na soshal midịa nke gosiri ebe Mohammed gara leta n'ama egwuregwu ndị otu bọọlụ Real Madrid. Na foto ndị ahụ, Mohammed yi akwa agbada ma yikwasa ya 'coat' n'elu. Ụfọdụ kwuru na ekike ahụ adabaghị adaba, ebe ndị ọzọ kọwara na nke a nwereike ịbụ maka na Febụwarị bụ oge 'Winter' nke bụ oge nnukwu oyi na-atụ na mpaghara Yurop. Patience Jonathan, nwunye aka chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan wuru ewu na soshal midia maka ekike ya n'ụbọchị ekeresimesi afọ 2017. Uwe ahụ dịka o nwere ọtụtụ ugbele nnụnnụ na ya, nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji were ya na-atụnyere ọkụkọ ọcha. N'oge Barack Obama bụ onyeisiala Amerịka, ụfọdụ ndị mmadụ katọrọ foto nwunye ya bụ Michelle dịka ha kwuru na nwunye Onyeisiala ekwesịghị iyi akwa na-egosi aka ya. Mana ọtụtụ ndị ọzọ kwadoro Michelle ma kwuo na nkatọ a na-akatọ ya erijughị afọ. https://www.bbc.com/igbo/articles/c9x38yprzy7o +sports Chelsea vs Bayern Munich: Bayern etiela Chelsea 'duka duka' ka onye e jidere n'ohi Ndị Chelsea nabatara ndị Bayern Munich na Stamford Bridge maka asọmpi agba nke iri na isii nke Champions League, kama Bayern egosighị ha nsọpụrụ dịka ha ji ọkpụ goolu atọ asataghị otu wee metọọ ha na be ha. Dịka a gbachara ọkara nke mbu, ọ dịka ndị otu Chelsea ama ihe ha na-eme, mere ka ndị na-akwado ha nwetu obere olileanya. Ha chịkwa ọkụ wee bata, mana Serge Gnabry gbabuuru Arsenal bọọlụ gosiri na ya abụghị onye obi ọma, dịka o ji goolu were menyụọ ya bụ ọkụ na olileanya ha nwere, na nkeji 51. Gnabry ezukwaranụ ike? Mba! N'ihi na o jikwara goolu ọzọ o nyere na nkeji 54 nke mezuru ya abụọ, na-erughi nkeji atọ o nyechara nke mbụ. O nyegidere nsogbu, ma nwakwaa inye goolu ọzọ nke gaara emezu ya atọ, mana o riri ya. Dịka agadị nwaanyị na-anaghị aka nka n'egwu ọ maara agba, Robert Lewandoski mezuru ya atọ na nkeji 76. Ka ihe niile a na-eme, ndị Chelsea bịara dizie ka ndị na-achụ oke ebe ụlọ ha na-agba ọkụ. Lịka lịka niile ha gbara bụ amịtaghị mkpụrụ, naanị akwụkwọ ọbara ọbara ka ha gbatara na nkeji 73, mgbe Marcos Alonso metara ihe e ji chụpụ ya. Otu ihe ndị mmadụ kwesịrị ịma bụ na e meribeghị Bayern Munich n'agba nke iri na isii kamgbe ha bidoro zọwa iko Champions League. Marakwa na ọ bụ Bayern ka Chelsea meriri n'afọ 2012, iji bulie Iko Champions League. Ka ọ dị ugbua, naanị ihe ga-azọ Chelsea ndụ n'asọmpi a bụ ma ọrụ ebube mee n'isi ha, ma ọ bụrụ na Chelsea nye goolu anọ ma ndị Bayern asataghị otu mgbe ha ga-ezute ọzọ. Otu abụọ a ga-ezute n'Allianz Arena bụ be ndị Bayern, n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị, afọ 2020. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51633003 +politics Anambra state: Ọgbaghara dị n'etiti ndị na-achị ehi na Anam akwụsịla - Kọmishọna mgbasa ozi N'Anambra, kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Don Adinuba na steeti ahụ ekwuola na gọọmenti edoziela esemokwu mere n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi n'izu ụka gara aga n'Anam. Adinuba kwuru na ọ bụ site na mkparịtaụka ndị ọnụ na-eru n'okwu na steeti ahụ na ndị Anam ebe nsogbu a mere nwere ka eji gbonwụo mwakpo a. O kwukwara na ọ bụ ndị ọchị ehi si obodo ọzọ bata Anam kpara ya bụ mkpa mkpa. Ime njem na-aga n'ihu ugbu a n'ọdụugboelu Sam Mbakwe dị n'Owere, na-agbanyeghi ihe mberede ọkụ ọgbụgba mere ebe ahụ n'ụbọchị Monde .Ihe mberede a nke mere n'elekere abụọ nke ehihie, tinyere ọtụtụ mmadụ nakwa ndị njem n'ọgbaghara.Anya hụrụ ka osi mee gwara BBC Igbo na ihe mberede a malitere mgbe ndị na-ere ahịa n'akụkụ ebe ahụ nọ na-enwe nzukọ maka ọkụ ọgbụgba.Mbọ BBC Igbo gbara ịnu ọnụmmiri okwu onyeisi ọdụụgbọelu ahụ bụ Rejoice Ndudinachi kụrụ afọ n'ala n'ihi ọ juwara isi na ya agaghị ekwu ihe ọbụla. Anyị akpọpụtala ndị nile bi n'obodo Jakana dị na Bono steeti ka anyị chekwa ha ma nwe ohere wakpo ndị Bokoharam juru ebe ahụ Ụlọrọ mgbasa ozi Punch depụtara na ọ bụ Abdulkadiri Ibrahim bụ onụ na-ekwuru NEMA kwuru nke a. Ibrahim kwuru na-akpọgara ha n'obi ndị gbara ọsọ ndụ dị na Obodo Maiduguri. Aka chiburu South Africa bụ Jacob Zuma agọrọla isi ya. Ọ na-ekwu na aka chiburu Libya nwụrụlanụ bụ Muammar Gaddafi enyeghị ya ego ruru nde dọla iri atọ iji gbapụta ya n'ulọikpe mgbe ọ dị ndụ. Akajiakụ Otedola awụsala Christian Chukwu Dọla? Ọ gwara ụlọọrụ mgbasa Ozi cable na o mere nke a maka etu Christian Chukwu onye bụbụ onye nchịkọta Super eagle si wepụta obi ya fee ala nna ya n'oge gara aga. Ebe a ga-amata n'etiti Mancity na TottenHam nakwa Leceister City na Porto Fc, onye ga-eji ibe ya gwọrọ ajụ n'asọmpị Champions League nke mgbede a. Ka anyị bata na Ondo steeti ebe ndị omekome gburu mmadụ asaa ebe ha gara izu ohi na ụlọakụ First Bank dị n'Idoani, bu obodo dí n'okpuru óchíchi Ose. Ndị isiekwe ọnwụ a bidoro gbawa egbe aghara aghara, ebe ha ji ogbunigwe gbarie ọnụụzọ ya bụ ụlọakụ were buru ego waa. Hope Uzodimma agawa ụlọikpe. Ọ sị ụlọikpe kagbuo mmerị Inec nyere Emeka Ihedioha maka nrụrụaka ọ sị na-emere ntuliaka ọkwa gọvanọ na ọnwa Maachi. Anyị e sị Ondọ bata mba Isreal ebe Prime Minister Benjamin Netanyahu sọ na-azọ ọkwa ọnyeisiala nke ugboro ise ya. A ga-anwuru ya n'ọchịchị? Netanyahu nwere nchekwube na ọ ga-apụta dika onyeisiala agbanyeghi ebubo mpu na nrụrụaka ndi uweojii mba ya boro ya. N'egwuruegwu, otu egwu bọlụ mba Canada ejirila ọkpụ abụọ asatara otu nyụọ otu Super Falcon nke Naịjirịa anya n'egwu bọlụ enyi na enyị ụmụnwaanyị ha gbara ụbọchị Monday na Canada. Nwafọr Desire Oparanozie ji otu ọkpụ gbara isi onwe ya na ya bụ egwuruegwu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-47864371 +entertainment Arochukwu tourist attraction: Lee ogogo 79 ndị ohu ruru ihe kariri afọ narị anọ gara aga n'Arochukwu Arochukwu dị agbata oke Akwa Ibom na Abia steeti mana ọ dị n’ime Abia steeti nke Naịjirịa. Arochukwu nwere otutu ihe nwereike ịrata ndị na-eme njem nleta. Ihe ọtụtụ jiri mara ya bụ maka arụ ndị Igbo a na-akpọ Ibin Ukpabi bụ nke Bekee “Long Juju”. Mana e nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ nwereike ịrata ndị mmadụ n’obodo ahụ nke gụnyere Olụ nat okoroji bụ dike ama ama mgbe gboo maka ike ọ kpara mgbe ndị Aro gbara ohu. Ihe ọzọ bụ ogogo iri asaa na itoolu bụ ebe ndị ohu ruru ihe karịrị narị afọ anọ (400 years). I ru ya bụ ogogo bụ ihe e jiri taa ụfọdụ ndị ohu na-enupuisi ahụhụ mgbe ahụ. Agbanyeghị na ana ekwu na ọnweghị ụzọ e si gawa Aro di nso, enwere ọtụtụ ihe agbaochie nwereike ịrata mmadụ ebe ahụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-60177343 +health Sleeping habit: Nrọ ọjọọ a ga-egbochinwu ụjọ ma mmadụ mụrụ anya? "Ọ bụrụ na ị rọrọ nrọ ọjọọ n'abalị foro taa, o nwere ike ịbụ ezigbo ihe. Nke a bụ makana ndị nchọpụta ekwuola na nrọ ọjọọ na-eme ka ụjọ belata n'ahụ gị mgbe ị tetara n'ụra. Ndị nchọputa a nọ na mba Swizaland na Amerịka nyochara etu ụbụrụ mmadụ si anabata nrọ dị iche iche. Ha chọpụtara na nrọ ọjọ na-akwalite etu ụbụrụ mmadụ si anabata ihe ụjọ ma onye ahụ mụrụ anya. Mana ha chọpụtara na nrọ na-eyi oke egwu a kpọrọ ""nightmares"" na Bekee, na-emetụta mmadụ n'ụzọ na-adịghị mma. Dọkita na-ahụ maka ụbụrụ na mahadum nke Geneva, Mahadum nke ụlọọgwụ Geneva dị na Swizaland nakwa mahadum Wisconsin dị n'Amerịka, na-ekwu na e nwereike iji nrọ gwọọ ọrịa nchekasị. Nchọpụta a gụnyere ịma ma nrọ maọbụ oke ajọ nrọ enwere uru ọ baara mmadụ ma ncha. Mpụtara ya, nke e tinyere na ngalaba 'Human Brain Mapping' gosiri na ajọ nrọ na-enyere ndị mmadụ aka ka ha nabata ihe ụjọ na-eme na ndụ ha. Ka ajọ nrọ na-abawanye, ka ikike ibelata ụjọ na-abawanye n'akụkụ ụbụrụ na-ahazi etu mmadụ si anabata ụjọ. Nke a gosiri na nrọ ọjọọ na-akwado ndị na-arọ ya maka etu esi agbanarị ụjọ ma ha teta n'ụra. Mana nrọ ahụ jiri oke ajọ ụjọ bịa, o nwereike imebi ihe na ndụ mmadụ dịka Lampros Perogamvros onye nchọpụta na mahadum Geneva si kwuputa. Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50619961 +entertainment Marriage Proposal: Etu ụmụnwoke si agbado nwaanyị taa na mgbe gboo Ị kpaa onye okenye aka n'ọnụ gbasara etu ụmụnwoke si agbadọ nwaanyị ha chọrọ ilụ taa, onye okenye ahụ ga-asị gị na ụwa emebiela. Ụmụnwoke oge a na-ahụ nwaanyị ha chọrọ ịlụ buru ụzọ mee enyi, oge ụfọdụ a kwaa iko ma tụọ ya ime tupu ha alarụọ ụlọ ga gwa ndị nwe nwa ebumnuche ha. Mana ị ga-ama ụzụ kpụrụ gị ime ụdị ihe dị etu ahụ n'oge gboo. Ọtụtụ ihe ndị a agbanwela nke mere na ndị okenye na-apụta eti aka n'obi na ndị ntoroọbịa anaghị emeta ya cha cha, ọkachasị etu nwoke si agbado nwaanyị si ya lụba ya. N'ụwa taa, nwoke na-esekpu ala arịọ nwaanyị ma jụọ ya ma ọ ga-alụ ya. Otu onye tiri mkpu ahụ bụ onye a ma ama na-eme ihe onyonyo nke a na-etu Ọgadagidi, Pete Edochie. Edochie bere nwịị na ọ bụ arụ ka nwoke sekpuru ala rịọ nwaanyị si ya ma ọ ga-alụ ya. O kwuru hoha na nke ahụ abụghị etu e si eme ya n'ala Igbo. O kwuru na nwoke ekwesighi ire ugwu ya ebe nwaanyị ọ chọrọ ịlụ nọ ime ụdị ihe ahụ. Mana ajụjụ ọtụtụ ndị Igbo na-etolite etolite na-ajụ bụ kedụkwanụ etu e si agado nwaanyị n'ala Igbo. Nwoke chọrọ ịlụ nwaanyị, ọ bụrụ na o jighi ọla sekpuru ala rịọ nwaanyị ma ọ ga-alụ ya etu anyị siri mụta n'aka ndị ọcha, kedụ ka ọ ga-esi mee ya? BBC Igbo gbara otu onye okenye aha ya bụ Peter Ezembu ajụjụọnụ ịmata etu omenala si eme ya. O kwuputara ụfọdụ ụzọ e si achọta nwaanyị a ga-alụ n'oge gboo. Mana n'okwu nke na-eme n'etiti ndị toro eto, Ezembu kọwara na mgbe gboo, nwoke anaghị agwa nwaanyị na ọ chọrọ ịlụ ya maka na ọ bụghị ya na-aga alụta nwaanyị ahụ n'aka ya, kama ọ bụ nna ya na ụmụnna ya ga-alụtara ya nwaanyị. Nke ahụ mere na nwoke ahụ ga-ebu ụzọ gwa nna ya na o nwere nwaanyị ọ hụrụ. Nna ya ga-akpọrọ otu onye ụmụnna ya ga na be nwaanyị ahụ ga gwa nna nwaanyị na o nwere ọrọma chara acha ha hụrụ n'ụlọ ha, ha chọrọ ịwọrọ, kọwaa etu nwaagbọghọ ahụ dị. Ebe ahụ ka ha ga-amalite nna nwa ahụ ga-akpọpụta nwagbaghọ ahụ gwa ya na nwamadị ahụ chọrọ ịlụ ya ma o kwetara. Nwa agbọghọ ahụ kweta, e tinyezie ụbọchị nwoke na ụmụnna ya ga-abịa. Mana taa, nwoke hụ nwaanyị ọ chọrọ ịlụ, o buru ụzọ sekpuru ala, nye ya ọla jụọ ya ka ọ g-alụ ya, nwaanyị ahụ kweta, ha aga n'ụlọ ya gaa jụzie nne na nna ya. Nke ahụ ka Edochie sịrị mba na ọ dịghị mma. Mana ajụjụ bụ o nwere ihe ọjọọ dị na ya? Ọ bụrụ ya bụ naanị otu oge nwoke ga-esekpuru nwaanyị ya ala, ọ dị njọ? Ajụjụ a ka anyị jiri gakwuru Pete Edochie onye gbara isi akwara sị mbakwa, nwoke anwala ya anwa. Mana omenaala bụ mmụta mmụta, i weta ebe a, i tinye ebe a, ụmụntoroọbịa Igbo anatala ndị ọha nke ahụ, ha kwukwara na ha ahụghị ihe ọjọọ ọbụla na ya. Oge BBC Igbo jụrụ ndị mmadụ ihe ha chere gbasara ya na Facebook, ụfọdụ kwuru na ọ dị mma ebe ụfọdụ kwuru na ọ jọgburu udele sigbuo nkakwụ n'isi. Otu ihe dị mkpa n'alụmdi na nwunye bụ nkwekọrịta dị n'etiti mmadụ abụọ ahụ. Etu ọbụla o si dị onye mma, ya mee makana omenaala na-agbanwe agbanwe. Nwa ntịị ebe a, nwa ntịị ebe a, ụnụ a na-aga. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50510024 +business Nigeria Poverty Index: Ị dara ogbenye? Akwụkwọ mpụtara ọhụrụ nke otu enyemaka bụ Oxfam wepụtara na-ekwu na pasentị 69 na mmadụ niile nọ na Naịjirịa dara ogbenye. Mgbakọ ya gosiri na ọ bụ mmadụ nde 138 n'ime ihe karịrị nde 200 bụ ihe dara ogbenye na Naịjirịa. Constant Tchona bụ onyeisi Oxfam na Naịjirịa kwukwara na Naịjirịa nọ n'ọkwa 125 n'ime mba 145 n'enweghi nhata nha. O kwuru na gọọmentị etiti anaghị enyere ọnọdụ a aka site n'etinyeghi ego n'ihe gbasara ahụike, agụmakwụkwọ, mmiri ziri ezi nakwa ọnọdụ ụmụnwaanyị. Etu ịga esi maraonye gbara ogbenye? Ụlọakụ Mbaụwa niile bụ World Bank manyere atụmatụ iji chọpụta ndị dara ogbenye na mba ọbụla n'afọ 1993. Ya bụ na ọbụrụ na ịnaghị erite otu dọlla pụtara narị naira atọ na ọma kwa ụbọchị, ọ pụtara na ịdara ogbenye. Mana ugbua, a na-elegara ihe ndị ọzọ anya ịji chọpụta ọnọdụ ogbenye dịka: O nwere ụfọdụ ihe ndị ọzọ si na ya bụ akwụkwọ mpụtara pụta gụnyere: Gịnị ka gọọmentị Naịjirịa na-eme? Gọọmentị Naịjirịa malitere ụfọdụ atụmatụ iji hụ na achụpụrụ ụbịam kpam kpam na Naịjirịa. Ha gụnyere YouWin bụ nke bidoro n'afọ 2012 bụ nke na-enye ndị ntorobia chọrọ ịbido ahịa ego mbite. Trader-Moni bụ atụmatụ ọzọ yiri ya na-enye ndị na-azụ ahịa ego mbite iji kwalite ahịa ha. Ọzọ bụ N-Power bụ atụmatụ na-akwụ ndị enweghi ọrụ ụgwọ na-akuzikwara ha ihe tupu ha enweta ọrụ. Mana ihe ndị a amịtabeghị mkpụrụ dịka ngụkọ ụbịam na-egosi na Naịjirịa ka na-abanye ụbịam n'ike n'ike. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48947538 +business AfCFTA: Uru atụmaatụ a ga-abara Naịjiria "Dịka onyeisiala Muhammadu Buhari binyechara aka n'akwụkwọ maka nkwekọrịta azụmahịa na mba Africa, ọtụtụ mmadụ ka na-ajụ uru ọ ga-abara ha. Lee ihe ise mbinyeaka a ga-emere Naịjirịa. 1. Ọ ga-eme ka Naịjiria na obodo ndị nọ n'Africa Union na-azụ ahịa ruru ogo pasenti iri isii (60%) karịa iri na isii ha na-azụbụ. 2. AfCFTA ga-emepụta ebe azụmahịa kachasị na mba ụwa niile. 3. Ọ ga-enye ndị na-azụ ahịa na Najirịa ohere iso mmadụ ruru ijeri abụọ zụkọta ahịa. 4.Ọ ga-enye ndị Naịjirịa sonye na akụnaụba ruru ijeri dọla abụọ nke ka akụ na ụba Naịjirịa. 5. Ụmụ Naịjirịa na-azụta ahịa ga-erite uru na ndọkọrịta ga-adị n'etiti ọtụtụ ndị azụmahịa. Onyeisiala Mohammadu Buhari gara na Niger Republic ụbọchị asaa nke ọnwa July binye aka n'akwụkwọ maka atụmatụ ""African Continental Free Trade Area""(ACFTA) ga-ahụ na mba Afrika na-azụkọta ahịa na-enweghị nsogbu. O bụghị taa ka ekwụwere okwu ya bụ atụmatụ nzụkọrịta ahịa na mba Afrika. Atụmatụ mekọrịta azụmahịa nke mba Afrika kpụrụ afọ n'ala afọ gara aga mgbe Naịjrịa jụrụ na ha agaghị entinye aka na ya. Naịjrịa bụ mba kachasị na mba Afrika ma nọrọkwa n'isi ihe a na-eme na ya bụ ọgbakọ. Mgbe Naịjirịa sepụrụ aka na ya bụ ọgbakọ, ụwa che na ọgbakọ azụmahịa mba Afrika akpụọla afọ n'ala kpam kpam. Onyeisiala Buhari sị ka enye ya nwobere oge ka ya chebere ya bụ atụmatụ echiche. Kemgbe ahụ otu ehibere ilebe anya na azụmahịa Naiịjrịa akpọrọ ""Nigerian Office for Trade Negotiation"" sị na ha na otu ruru iri abụọ na asaa etikọọla isi maka ya bụ okwụ mata iri dị na ya. Uru dị na Naịjirịa ịnwete obosara ahịa na mba Afrika juru eju bara abara agbanyeghị na ọtụtụ na atụ egwu na ọrụ na ngwaahịa agaghịzị ezu ndị chọrọ ya. Ugbua Naịjirịa tinyegoro aka na-akwụkwọ nkwekọrịta a, Afrika ịwete obosara ahịa buru ibu dịka Urop adịwala nso. Ugbua Naịjrịa enweela ohere ịmekọrịta ha na mba ndị ọzọ nwere agba." https://www.bbc.com/igbo/afirika-48899195 +entertainment Ịwa ahụ gbanwere ndụ m n'ụzọ pụrụ iche - Chigozie Ginika Godwin """Ugbua, a na m ejikwazi ofụma"" Nke a bụ ihe Chigozie Ginika Godwin gwara BBC Igbo mgbe ọ na-akọ akụkụ gbasara ụkwụ ya gbaburu ngọ. Mgbe a mụrụ ya o nwere ihe sayensị kpọrọ ""ricket"" maọbụ ""bow leg"". Dịka ọ na-eto, ọ gabigara ọtụtụ ihe n'aka ndị mmadụ: ndị kọrọ ya ọnụ, ndị achọghị ịga ya nso na ihe ndị ọzọ. Nke a mere ka obi jụọ ya oyi ma kwụsịkwa ya ịgba bọọlụ ọ hụrụ n'anya maka etu o si raa ya ahụ. Mana mgbanwe bịaara ya afọ abụọ gara aga mgbe ụmụnne nne ya tụkọọro ya ego ma kpọga ya ụlọọgwụ ịwa ya ahụ. O were Godwin ọnwa iri igbake na nke a dịka ọ malitere ịmụ ịga ije ọzọ. Mana ugbua, ndụ ya agbanweela n'ụzọ pụrụ iche. Gee akụkọ ọma ya n'uju ebe a:" https://www.bbc.com/igbo/articles/c04g2gjx9v3o +health Coronavirus: Ihe ise mba ụwa kwesịrị ịmụta n'aka Naịjirịa Ọrịa coronavirus agbasaala na mba 114 n'ụwa kamgbe ọ malitere n'obodo Wuhan nke mba Chaịna. Naịjirịa sokwa na mba ebe ọrịa batarala. Oge nwoke onye Itali bubatara ọrịa na Naịjirịa, egwu tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n'ihi na ha che na gọọmentị agaghị enwe ike igbochi mgbasa ya bụ ọrịa Mana gọmentị Naịjirịa akpaala ike igbochi mgbasa ọrịa ọjọọ nke mere ka otu ahụike mbaụwa bụ 'World Health Organisation' weliere ha aka elu. 'Genome sequencing' Naịjirịa bụ mba izizi n'Afrịka mere ihe a kpọrọ 'genome sequencing' nke gosiri na nje ahụ bụkwa ụdị nje nke na-agbasa na mba Itali nakwa obodo Wuhan. Ngalaba mgbochi ọrịa bụ 'National Centre for Disease Control' kwuru na ndị nyere aka ime nke a bụ ndị mịnịstrị ahụike nke Legos steeti. Ha kesara ihe ha chọpụtara na nchọpụta a nye ndị ọrụ ahụike n'akụkụ ụwa niile. Onyeisi WHO kelekwara ndị ọkammuta sayensị Naịjirịa maka nke a. Mgbasa ozi Ụlọọrụ mgbasa ozi a tụkwasịrị obi dịka BBC na-agbasara ndị ọha obodo ihe niile ha kwesịrị ịma nakwa ihe ha kwesịrị ime iji zeere ọrịa ọjọọ a. Kwa ụbọchị, ụlọọrụ ntaakụkọ dị icheiche na-ewepụta akụkọ iji kuziere ndị mmadụ ihe ha ga-eme ma ha hụ onye na-arịa ọrịa yiri coronavirus. Ịchọta ndị niile ha na onye mbụ bu ọrịa a mekọrọ Gọọmentị Naịjirịa chọtacha ndị niile ha na nwoke Itali ahụ bubatara ọrịa coronavirus bakọrọ ụgbọelu. Na-agbanyeghị na ọtụtụ n'ime ndị ahụ anọghị na Legọs, gọọmentị kpọtụụrụ ha niile ma dọọ ha aka na ntị ihe ha ga-eme. Ọgbakọ onyoonyoo kama ọgbakọ ihu na ihu Dịka gọọmentị mara ọkwa na ọrịa coronavirus abatala Naịjirịa, ọtụtụ ụlọọrụ machiri inwe ọgbakọ ihu na ihu, kama ha malitere iji ịntaneetị enwe ọgbakọ n'igwe televishọn. Nke a belatara mmekọrịta ahụ mmadụ na ibe ya, nke bụ otu ụzọ ọrịa a si agbasa. Itinye ihe karịrị mmadụ 100 na 'quarantine' Na mkparịtaụka ya ndị ntaakụkọ n'abalị abụọ nke ọnwa Maachị, Kọmịshọna ahụike na Legọs steeti bụ ọkammụta Akin Abayomi kwuru na ha etinyela ihe karịrị mmadụ 100 na kwarantaịn. Ndị a bụ ndị ha na nwoke Ịtalị ahụ bubatara ọrịa coronavirus mekọrịtara ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51874222 +politics Nkwado Ndigbo: Peter Obi asaala Oshiomhole Peter Obi ekwuola na okwu onyeisioche APC bụ Adams Oshiomole kwuru na na ndigbo anabataghị ya dịka onye ga-esote Atiku Abụbakar n ọsọ nd��rọndọro ọkwa onyeisiala nke PDP na 2019 bụ ụgha. Obi, onye kwuru nke site n'onu ojeozi mgbasaozi ya bụ Valentine Obienyem kwuru na naani nsogbu e nweburu bụ a kpaghị ụka ahụ akpa. Ulọikpe ukwu atụpụla akwụkwọ ndị otu chọrọ ka nwoke lụwa ibe ya maọbụ nwaanyị lụwa ibe ya ha gbara Corporate Affairs Commission bụ ngalaba gọọmenti na-edebe aha ụlọọrụ dị na Naịjirịa. Ụlọọrụ CAC jụrụ ịdebe aha ndị otu a dịka otu tozuru ịrụ ọrụ na Naịjirịa. N'ofesi, Onyeisiala mba France bụ Emmanuel Macron akpọọla oku ka otu jikọtara mba Urope gbaa mbọ jikọọ ọnụ maka igbochi ọgbaaghara n'ụwa. Macron kwuru nke a na Berlin mgbe ọ gara emume maka ncheta ndị e gburu n'agha. https://www.bbc.com/igbo/46258570 +sports Madagascar vs Nigeria: A gbanyela Super Eagles anya ajụ "Madagaska ji ọkpụ goolu abụọ apịa Naịjirịa ụtali n'asọmpi Total AFCON n'Ijipt mabụrụ ndị mbụ n'otu ha. Madagaska ji ụtụtụ gbaa aka ahịa site na goolu Lalaina Nomenjanahary nyere mgbe Leon Balogun mehere n'ihu ọgbọ neetị nke Naịjirịa na nkeji 13. Dịka ọ dị ugbu Madagaska na-acha Naịjirịa ezigbo ọkụ dịka a na-atụghị anya maka na Naịjirịa ka nwere ndị egwu karịa ha. N'ime ọkara asọmpi a, Madagaska siri ọnwụ na Naịjirịa agaghị enyeta ha goolu ọbụla. Na nkeji 53 Madagaska mezuru ya abụọ site na ""Free kick"" Carolus Andriamahitsinoro gbara nkre kụrụ Wilfred Ndidi na-azụ ma banye na neetị. Ndị Madagasaka kere Super Eagles agbọ ma tọgbọọ ha, nke mere ha enweghi ike ịgbọ ụja ọbụla rue ngwụcha asọmpi a. Mmeri a mere ka Madagaska bụrụ ndị mbụ n'otu B nke asọmpi a." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48819537 +entertainment AMAA Award: 'Nollywood tinyere Naịjiria n'ihu mba ụwa' - Peace Anyiam-Osigwe Peace Anyiam-Osigwe bụ nwaada Igbo a ma ama n'ime ejije nke Nollywood kọwara BBC Igbo ka ya na ije siri malita na ọrụ ejije. Peace si na nne ya tụrụ anya na ya ga-abụ ọkaikpe, mana uche ya niile dị na ịme ejije, o kwukwara na nna ya kwadoro ya bụ atụmatụ. Ọ sị na ka ya malitechara ịrụ ọrụ ejije, na ya gachiri azụ n'ụlọakwụkwọ ịga mụọ maka ịbụ ọkaikpe. Ọ gwara BBC Igbo ka o si hibe emume nturuugo bụ AMAA Awards. Gee ya ntị n'uju. https://www.bbc.com/igbo/afirika-59472937 +politics Patience Jonathan: Ụlọikpe anakọrọla nwunye onyye bụbụ onyeisiala ego EFCC sị na o zupuru Ụlọikpe ukwu dị na Steeti Legọs enyela iwu ka gọọmentị Naijiria weghara ego dị nde dollar asatọ na ụma nakwa ijeri naira itoolu na ụma bụ nke a sị na Patience Jonathan zupuru oge di ya bụ Goodluck Jonathan bụ onyeisiala. Ọkaikpe Mojisola Olaterogun nyere iwu a n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Jụlaị bụ Monde wee kwuo na Patience enyeghi nkọwa zuru oke etu o si nweta ego ndị ahụ. Cheta na ngalaba gọọmentị na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka bụ 'Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)' gbara Patience Jonathan akwụkwọ n'ihi ebubo nrụrụaka. Ndị EFCC kwuru na Patience zupuru ego buru nnukwu ibu oge di ya bụ onyeisiala ma were ego ndị ahụ zụọ ọtụtụ ụlọ nakwa ala. Ha rịọrọ ọkaikpe ka o nye iwu ka eweghachiri gọọmentị ego, ụlọ na ala ndị ahụ Patience ji ego o zupuru wee zụọ. Akụkọ ga-amasị gi: https://www.bbc.com/igbo/afirika-48829420 +business David Malpass ga-anọchị anya Jim Yong Kim n'ụlọakụ mba ụwa niile N'ozi ụlọakụ ụwaniile bụ World Bank na Bekee zipụrụ site n'akara Twitter ha, ha kwuru na Malpass ga-ebido ọrụ n'ụbọchị Tuusde. Ha kwuru na mmadụ niile jịkoro aka họpụta ya dịka onye ndụ ụlọakụ ahụ. Ọ pụtara na David Malpass bụ onye mba Amerịka ga-anọchi anya Jim Yong Kim dịka ọ rituru n'ọkwa n'ọnwa Febụwarị. Ụmụakwụkwọ LUTH ebee arịrị Ndị uweojii na Legọs ekwuola na ha anwụchiela mmadụ abụo bụ ndị aka ha dị n'ọnwụ Stephen Urueye. Ndị uweojii kwukwara na ha amalitela nyocha banyere ọnwụ nwoke ahụ. Cheta na ọ bụ n'abalị ụnyaahụ ka ndị ohi zuru Stephen ohi ma sụọ ya mma n'ihu ụlọakwụkwọ LUTH dị na Legọs. Ha kwukwara na ọ bịara otu ụbọchị dịka o mechara mmemme ngụcha Mahadum. Ụmụakwụkwọ ahụ na-eme ngagharịiwe maka na ha na-ekwu na ọ bụghị taa ka ndị omekome bidoro ịmaja na ịwakpo ha. Dịka Hadiza Usman, onyeisi ngalaba n'ahụ maka ọdọụgbọmiri sị gwa ụlọakụkọ Bloomberg, Naijirịa na-arụ ọdọụgbọmmiri miri emi nakwa ọdọ ngwaahịa abụọ iji belata kpachikpachị dị na ọdọụgbọmmiri dị n'Apapa Legọs. Otu na Lekki Free Trade Zone dị na Legọs. Nke ọzọ na Badagry dịkwa na Legọs, ebe nke atọ bụ ọdọụgbọmmiri Ibom dị na Akwa-Ibom. Ụgwọ Naijiria gbazitere arịala elu site na tarịị Naira iri abụọ na otu na ụma(N21.73trn)ọ b�� n'afọ 2018 gbaruo tarịị iri abụọ na anọ na ụma(N24.39trn) dịka ngalaba na-ahụ maka ijikwa ụgwọ nke a kpọrọ debt Management office siri kwupụta ụbọchị Tọsde n'Abuja. O jiri pasent 12.25 gafe nke afọ 2018. Otu APC ekwuola na mmeju ntuliaka Inec mere na Bauchi, Sokoto nakwa Adamawa adanyeghị na anya ya dịka ha boro ebubo wuruwuru, tigbuo-zogbu na igo vote, ma kwuo na ha ga-aga ụlọikpe ịdọgha mpụtara ntuliaka ndị ahụ. Ha kwukwara na ebubo na onye nke ha bụ onye meriri na ntuliaka Gọvanọ na Kwara steeti Abdulrahman Abdulrazaq ji asambodo secondịrị adigboroja bụ akụkọ Mike ejeagha nke ndị e meriri emeri na-akọ. Ndị uweojii Legọs atuọla alo ha achụọ Inspector Olalekan Ogunyemi n'ọrụ uweojii ka e kpechara ya ikpe imeụlọ maka ogbugbu otu nwata nwooke a kpọrọ Kolade Johnson bụ onye a gbagburu ebe ọ na-ekiri oolu na Mangoro na Legos. Mana a hapụrụ ogbo ya bụ Sergeant Godwin Orji sị ya lawa na ikpe amaghị ya. Na egwuregwu, Danny Rose nke Tottenham kwuru na ike egwu bọọlụ agwụwala ya dịka ikpa oke agbụrụ na-ari ibe ya elu na bọọlụ. Rose, onye so ndị egwu ball England akwara emo na asompi e ji akwado Euro 2020 nke a gbara na Montenegro tụrụ arịrị na o nweghị ezi ahụhụ a na-enye ndị kpara oke agbụrụ na bọọlụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-47824828 +sports Senegal vs Tunisia: Onye ga-ezute Senegal n'ikpeazụ Afcon? "Sịnịgal emeriela mba Tunishia iji ruo agba ikpeazụ nke asọmpi Iko Mba Afrịka nke 2019. Mmeri a ha meriri site na goolu Dylan Bronn bụ onye mba Tunishia ji aka ya takpuo na neetị ha na nkeji 100, mere ka ha nwee ohere ịzọ ma lee ma aka ha a ga-emetụ Iko asọmpi a ma ncha. Nke a ga-eme ya naanị mkpụrụ ugboro abụọ Sịnịgala na-eru agba ngwụcha asọmpi a. Ihe tụrụ ndị mmadụ anya bụ etu mba abụọ a si richaa penariti a dọnyeere ha n'efere, mere ka egwuregwu ha banye agba ""gbaa ka anyị laa"" ebe e tinyekwuru ha nkeji 30. Ferjani Sassi nke Tunishia bu ụzọ rie na nkeji 75, ebe Henri Saivet nke Sịnịgal rịwakwara ndị be ha obi na nkeji 81. Ka anyị 'tụọ down' na mba Libya Ndị ụlọọrụ United Nations (UN) na-akpọ oku ka e mechie ebe ndị a na-etinye ndị gbara ọsọ ndụ, makana ọnọdụ ebe ahụ adịghị mma ịbụ ebe obibi nye ndị mbịarambịara. UN kwuru na ha dị njikere inyere ha aka wee na-elekọta ndị mbịarambịara a. Nke a na-abịa ka ihe karịrị mmadụ iri ise nwụrụ mgbe e si n'ụgbọelu tụsa mgbọ n'ebe a na-edowe ndị gbara ọsọ ndụ n'isiobodo Tripoli izu abụọ gara aga. Amnesty International na-ebo ndị uweojii Rivas steeti ebubo Ngalaba na-arụ ọrụ n'efu bụ Amnesty International ekwuola na ọ bụ ndị uweojii butere ọkụ gbagburu mmadụ iri anọ na asatọ n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Juun na Rivas steeti. N'akwụkwọ ozi ha zipuru, ha sị na ọ bụ ndị uweojii na-arụ n'Afam dị nso ebe okpo mmanụ na-ehi ehi malitere ịgba egbe ka a jụrụ inye ha aka azụ. Nnamdi Omoni bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ha emechabeghi nyocha, nke bụ na ha agaghị ekwu ma ihe Amnesty International na-ekwu ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị. A bịa n'egwuregwu, Novak Djokovic na Roger Federer na-achịpụ ya ugbua dịka ha na-azọ onye ga-emeri ma bulie iko Wimbledon nke afọ a. Federer merie, ọ ga-abụ Iko nke itoolu ya, ebe ọ ga-abụ nke ise ya ma Djokovic buru ya n'afọ gara aga merie. N'egwuruegwu, Naịjiria na Algeria ga-akwata n'agba ọkara-ikpeazụ n'elekere asatọ nke abalị Julaị 14, n'asọmcoza pi Afcon. Mmadụ abụọ ndị oji ego achụ ego ndị Naịjirịa ekwela nkwa na ha ga-enye ha puku dọla iri ise maka otu goolu ọbụla ha nyere ndị Algeria. Onye nnọchite anya Naịjria na Saụt Afrika bụ Godwin Adams ekwuola ka e nyonyekwuo anya n'okwu gbasara ọnwụ Elizabeth Ndubisi Chukwu bụ onye egburu n'obodo ahụ. Adams na-akọwata na mgbe ụfọdụ na ọ bụ ekewe eketeghị n'etiti ndị Naịjirịa ụfọdụ bụ ihe na-ebute ụdị ọnwụ ike a. Ọnụ na-ekwụrụ ndị uweojii na Naịjirịa bụ Frank Mba ekwuola na ọ bụ ndị aka ha dị ọcha ka ekwesiri ịnabata na ọrụ nchekwa ime obodo. Na mkparịta ụka ya na ndị nta akụkọ, Frank kwuru na obodo ọbụla nwere ikike ịbido ndị otu nchekwa obodo nke ha ma ha soro usoro iwu kwuru. Ndi ogbu ara ọnara a hapụla iruuju, anyammiri na ọbara na Somalia N'ofesi, mmadụ iri abụọ na isii anwụọla na ogbunigwe na egbe ndị omekome gbara n'ụlọ oriri na nkwari dị na Kismayo, Somalia. Ndị ogbu ara ọbara kpọrọ onwe ha al-Shabab ji ya bụ arụrụala anya isi. Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo etinyeela ọnụ na nkatọ ogbugbu Funke Olakunrin bụ nwa onyeisi ndị Afenifere bụ Funke Olakunrin nke a na-eche na ndị ọchị ehi dị na ọnwụ ya. Obasanjo gwara gọmenti ka ha jisike jide ndị rụrụ ala ahụ taa ha ahụhụ dịka iwu kwuru. N'aka ọzọ, onyeisiala Muhammadu Buhari ekwela nkwa na ndị ọrụ nchekwa ga-achọtariri ndị mere ya bụ ihe ma taa ha ahụhụ ka okwesiri." https://www.bbc.com/igbo/48979769 +health Ọnụọgụgụ ndị ebola na-egbu na Congo ka na-arigo Akụkọ ndị kachasị mkpa taa: Na Congo, ebola egbuola ihe ruru mmadụ iri ise na ise dịka ndị ọrụ ahụike ha si kwuo, Ebe ihe ruru mmadụ iri anwụọla na mba Italy ka idemmiri buuru ha na mpaghara Calabria. Onyeisiala Muhammadu Buhari mere ihe tụrụ ndị mmadụ n'anya ka o ji ụkwụ gaa ihe ruru kilomita narị asatọ taa. O rituru sonye ndị ji ụkwụ na-aga maka na ndị na-akwado ya nọchichara ụzọ gbochiri ụgbọala ya igafe ka o si ebe ọ gara ekpere maka Sallah na-ala n'ụlọ ya na Daura. Ọganiihu ndị Aba Ndị na-arụ akpụkpọ ụkwu n'ahịa arịarịa dị n'Aba gwara BBC Igbo na ọ bụrụ na e nye ha ohere, na ha ga-arụ akpụkpọ ụkwụ ndị Naịjirịa niile ga na-eyi. Ha kwukwara na ha chọrọ enyemaka gọọmentị inweta ngwaọrụ na ihe ndị ọzọ ha ji arụ ọrụ. David Beckham wụsara akpụkpọ ụkwụ o ji agba bọọlụ n'afọ 2013, ga-enweta nturuugo n'aka otu UEFA. Beckham ga-enweta nturuugo onyeisi UEFA maka onyinye ọ nyere egwuregwu bọọlụ nakwa etu o si akwado bọọlụ n'akụkụ ụwa niile. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Na agbanyeghị nsogbu dị n'etịtị ndị obodo ọzọ dị na Naịjirịa na ndị Fulani na-achi ehi, Akwuke na ndi na-achị ehi na-ebi n'udo. https://www.bbc.com/igbo/afirika-45264572 +health Male Contraceptives: A ga-agbawa ụmụnwoke ọgwụ mgbochi nwa - Ndị dọkinta "Ka ọ kwụ ugbua, ndị dọkịnta n'India na-akọwa na ha arụpụtala ọgwụ ga-eme ka nwoke ghara ịtụwa nwaanyị ime mgbe ọ na-achọghị. Ndị dọkinta a sị na enyochala ọgwụ a ma chọpụta na ọ na-arụ ọrụ ruo pacenti 97.3 ma kwukwa na ọ naghị enye nsogbu ọbụla n'ahụ. Ha sị na ọ bụ onye ji asambodo ọrụ ọgwụgwọ ga-agbanyenwu ọgwụ a a na-agba n'akpa amụ onye chọrọ. Ya bụrụ na okwu ha wepụtara bụrụ eziokwu, ọ ga-abụ mbụ e nwere ọgwụ nwoke ga-aṅụ maka igbochi nwa. Ụgbua, ọ bụ naanị ụmụnwaanyị nwere ọgwụ e ji egbochi nwa. Ihe ụmụnwoke nwere ha ji egbochi nwa bụ okpu nna bụ enyị, bụ nke Bekee kpọrọ ""condom"", maọbụ ịmịpụ amụ tupu ha anyụpụ olulu. Otu a kpọrọ ""Indian Council for Medical Research"" si na ọgwụ a adịla ""njikere"". Nkọwa ha bụ na ọgwụ a agaghị egbochi nwoke ịtụ nwaanyị ime kpam kpam. Ha si na ọ ga-arụ ọrụ ruo afọ 13 ma bụkwara ihe ndị achọghị ka eme ha nke Bekee kpọrọ ""surgical vasectomy"" ga-eme. Onwekwara mba ndi ọzọ na-achọ ịrụpụta ụdịrị ọgwụ a dịka Amerịka na Briten. Maazi Sagay sị ka atụọ Magu ugo Otu ndụmọdụ Onyeisiala Buhari n'ọkwu nrụrụaka akwadola ka e nyefe Ibrahim Magu na-arụ ọrụ dịka onyeisi EFCC ọkwa a n'uju. Onyeisi otu a bụ Itse Sagay sị na Magu etinyela ụjọ n'ahụ ndị na-ezu akụnaụba Naịjirịa nke mere ha aripu ọsọ. Magu agaala njem ntuzu ugo a ugboro abụọ mama ndị sineti gbajọrọ inye ya ohere ịgafe. APC ahọpụtala gọvanọ Abdullahi Ganduje nke Kano Steeti na ndị ọzọ ka ha ga mee udo n'etiti ndị otu ha n'Edo Steeti Cheta na ogbogbo nsogbu dị n'ime APC nke Edo Steeti n'ihi esemokwu dị n'etiti gọvanọ Godwin Obaseke na onyeisioche APC bụ Adams Oshiomole. Obaseke chọrọ ịzọ ọkwa govano ọzọ, mana ọ dịka nna ya ukwu Oshiomhole achọghị. Jose Mourinho ekwela ndị Tottenham nkwa iji ọnụnụ ọkụ na obi ụtọ arụ ọrụ ya dịka onye nchịkọta ha Nke a ọ bụ nkwa a sị nwoke kwere nwaanyị n'elu akwa? A chọpụta ma egwu biri ọkụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50499590 +health World Sickle Cell Day: Onye na-arịa 'Sickle Cell' ga-enwete uru na nri ndị a Dịka taa bụ ụbọchị ncheta ọrịa ọbara nko nke bụ 'Sickle Cell' na Bekee, ndị ọkachamara na nri na ihe ọ na-enye n'ahụ enyela ndụmọdụ ọhụrụ Florence Ngozi Uchendu kwuru na o nwere ụfọdụ nri ndị na-arịa ọrịa a kwesiri ị na-eri iji chekwa onwe ha ọfụma karịa ndị enweghi ọrịa a. O kwuru na nri ndị na-enye ike dịka akpụ, ji, osikapa na ndị ọzọ dị mma iji nye ha ike n'ihi na ọrịa a na-agwụ ike. O kwukwara na akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi dị icheiche na nye aka ịnye ha ihe ndị na-edozi ahụ. Ọ kwuru na ọ bụ maka na ndị na-arịa ọrịa anaghị enweta ihe dịkia Ayọn, vitamins, kalshiụm wdg. Nri ọzọ ọ kpọrọ aha bụ mmiri ala ehi nke ga-enye ha kalshiụm n'ahụ nakwa mmiri ọṅụṅụ nke ga-akwụsị ahụ mgbu. Dịbia bekee ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ McGinger Ibeneme kwuru na ezigbo nri zuruoke nakwa ihe ndị ọz��� nwereike ịdọtị ndụ ndị na-arịa ọrịa ọbara. O kwuru na ndị na-arịa ụdịrị ọrịa na-enwe ọtụtụ nsogbu gụnyere ọkpụkpụ mgbu, obi mgbu, ịrịa ahụ mgbe ọbụla. Kedụ ihe ị ga-eme ka ịnwe ogologo ndụ n'ọrịa a? Macginger kpọpụtara ihe ndị ha ga-eme iwe bie ogologo ndụ: Ọ sị ka ha ahọrọla nri ọbụla. Maka na ọ bụ na nri ka ha ga-enye ihe n'ahụ. Mcginger kwuru na ọ bụ naani site n'inyocha iji wee chọpụta ma onye gị na ya na-alụkọ dị na nwunye ,ma ọbara ụnụ agakọrọ nkeọma. Nke a gunyere :AS na AS agaghị alụli, mana AS na AA ga-alụli. @Taswalu na-arịọ ndị mmadụ ka ha nyocha onwe ha tupu ha lụọ. @toksy_bee_ chọrọ ka ekpere ya ekpere ya makana ya bụ ọrịa ji ya na njọ. @EkeminiMacauley kwuru na ya na-akwado ndị na-arịa ọrịa a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48689366 +politics Anambra Transition committee: Ihe mere Soludo jiri họpụta Ezekwesili na ndị ọzọ "Charles Chukwuma Soludo ahọpụtala Oby Ezekwesili na ndị ọzọ dịka kọmitii ga-enyefe ya ọchịchị a kpọrọ 'transition committee' n'ọkwa ịbụ gọvanọ Anambra steeti. N'ozi Soludo wepụtara, Oby Ezekwesili ga-arụ ọrụ dịka onyeisioche kọmitii ahụ bụ ndị ga-ahụ na o were ọchịchị n'Anambra Steeti n'ọnwa Maachị afọ 2022. Otu n'ime ndị ọ họpụtara bụ Lawrence Mefor gwara BBC Igbo ka obi dị ya nakwa ihe mere Soludo jiri họpụta ha. Mefọr sị na nhọpụta ya na ndị ọzọ bụ ihe ziri ezi maka na o nweghi onye Soludo ga-akpọ oku ka ọ ghara ịza. Ọ sị na ihe mere e ji họpụta ndị maara nke ekwe na-akụ na ngalaba dị iche iche bụ maka na ịhazi ọchịchị adịghị mfe. Mefor sị na ha ga-eleba anya na ngalaba dịka akụnaụba, agụmaakwụkwọ, ahụike, azụmaahịa, ụmụnwaanyị, ndị ntoroọbịa dgz ma bunye Soludo uche ihe o nwereike ime ka ọchịchị ya mee ọfụma. Cheta na Chukwuma Soludo meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti n'ụzụ ụtụtụ Wenezde Nọvemba 7, 2021. O ritere mmeri n'okpuruọchịchị iri na itoolu n'ime iri abụọ na otu nke steeti ahụ. Soludo ji ọkọlọtọ APGA zọọ ya bụ ọkwa nke o ji vootu 112,229 merie ogbo ya nke PDP bụ Valantine Ozigbo bụ onye nwetere vootu dị 53,807. Charles Chukwuma Soludo bụ onye Isuofia, n'okpuruọchịchị Agụata Anambra steeti. O tokwara n'Anambra steeti, ya mere ya na ndị ma ya ji akpọ ya 'ọkụkọ Igbo'. Soludo dị afọ 61, aha nwunye ya bụ Nonye Soludo, ha mụrụ ụmụ isii. Ọ bụbu onyeisi ụlọọrụ Central Bank of Nigeria, site na 2004 ruo 2009. Ọ bụghị mbụ ọ na-apụta ịzọ ọkwa gọvanọ dịka ọ nwara n'afọ 2010 n'okpuru PDP, mana Peter Obi meriri ya. Ọ nwakwara n'afọ 2013 n'okpuru APGA, mana ndị nnyocha otu pati ahụ kwuru na o tozughi. Lawrence Mefor sị na 'transition' pụtara ngafe site n'otu ebe banye n'ebe ọzọ, ya bụ ""isi n'ọchịchị gafe n'ọchịchị ọzọ"". ọ sị na ọrụ komitii a bụ ịhụ na ọchịchị nke ochie kọwaara ọchịchị nke ọ hụrụ ka ihe si kwụrụ iji nyere ha aka ịmalite ọrụ na-egbughi oge. Mefor sị ma emeghi etu ahụ na ọ ga-enye ọchịchị ọhụrụ nsogbu ịmata ọrụ na ha agaghị ka ha ga-esi malite ọrụ ha. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ihe ọzọ komitii a na-eme bụ ibunye uche maọbụ ịtụ arọ ka ọchịchị ọhụrụ ga-esi malite ọrụ. Na ọ dịziri gọvanọ maọbụ onyeisi ọchịchị n'aka ịṅa komitii a ntị ịgba arọ ha tụnyeere. Soludo ga-eburu oche ọchịchị n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Maachị afọ 2022 site n'aka Willie Obiano chịrịla Anambra afọ asatọ. Kọmitii a ga-amalite ọrụ ha n'ụbọchị iri na itoolu ruo ụbọchị iri abụọ na abụọ nke Jenuwarị afọ 2022. Ndị so na kọmitii a gụnyere: 1) Mrs Oby Ezekwesili (Chairperson) 2) Prof. Benedict Okey Oramah 3) Rt. Hon. Uche Okafor 4) Prof. Pat Utomi 5) Prof. Chidi Odinkalu 6) Mr. Steve Nworga 7) Chief Osita Chidoka 8) Hon (Dr) Ben Nwankwo 9) Hon Charles Odedo 10) Barr Tony Ifeanya 11) Mr. Ferdinand Agu 12) Prof. Osita Ogbu 13) Chief Chikwe Udensi 14) Dr. Greg Ibe 15) Dr. Alex Otti 16) Mr. Coleman Uba 17) Chief Collins Chikeluba 18) Engr (Sir) Chris Okoye 19) Prof. (Mrs) Uche Amazigo 20) Barrister Pat. Ikwueto, SAN 21) Dr. Olisa Agbakoba, SAN 22) Barrister Echezona Etiaba, SAN 23) Prof. Offornze Amucheazi, SAN 24) Engr. Emeka Ezeh 25) Chief Leon C. Mezue 26) Hon Chike Anyaonu 27) Hon Evarist Uba 28) Dr. P.C.J Adibe 29) Chief Akachukwu Nwankpo 30) Dr. Mefor Law 31) Dr. Alex Obiogbolu 32) Dr Godwin Owoh 33) Dr. Greg Ugochukwu Ezeilo 34) Mr. Epundu Emechebe 35) Mr. Christian Udechukwu 36) Chinyere Ossy Okoye, Esq 37) Chief Don Eze 38) Mr. Chijioke Uwaegbute --- PWC 39) Mr. Franklin Edochie 40) Mr. Dozie Okpalaobieri 41) Ms Nkoli Anyaoku 42) Ms Uche Onwuamaegbu 43) Mr. Innocent Isichei 44) Mr. George Nwangwu 45) Mr. Ikechukwu Nweje 46) Dr. Innocent Okpanum 47) Arc Henry Arize 48) Dr. Will Fleury 49) Barrister Udu - Former Head of Service 50) Dr. Emma Ezenwaji 51) Prof. Phil Phil-Eze 52) Mr. Joe Anatune 53) Mr. Ike Chioke 54) Prof. Ifedioramma Eugene-Mary Nwana 55) Mr. Emma Onyilofor 56) Ms Prisca-Anne Nwangwu 57) Ms Chinwe Jane Okoli 58) Mrs Amaka Obi 59) Fred Chukwuemeka Agbata 60) Mr. Chinedu Nwoye 61) Dr. Nelson Omenugha 62) Prof. Nkechi Ikediugwu 63) Prof. Ike Uzochukwu 64) Dr. Emeka Okeke 65) Dr. Polycarp Emenike 66) Dr. Godwin Nnadozie 67) Engr. Ifeanyi Okeoma 68) Amb Uche Ajulu-Okeke 69) Chief Pat Ubajaka 70) Prof. Okey Ikeanyibe 71) Comrade Charles Onyeagba 72) Prof. Au Nnonyelu 73) Dr. Forster E. Ihejiofor 74) Mr. Odera Ozoka 75) Mr. ThankGod Ibeh 76) Prof. Sylvia Chika Ifemeje 77) Mr. Kanayo Nwafor 78) Comrade Churchill Okonkwo 79) Sir Damian Okolo 80) Dr. Chinedu Onyeizugbe" https://www.bbc.com/igbo/59985609 +health Ụdịrị ọrịa kansa ara kachasị arịa ụmụnwaanyị isiojii na ụzọ e si egbochi ya Ndị nyocha sayensi mba Amerịka enyochapụtala njịkọ dị n’etiti ajọ ọrịa kansa nke ara na ụmụnwaanyị isi ojii. Nyocha ha gosiri na ọ bụ ụmụnwaanyị isi ojii ka ọrịa a kacha awakpo. Ha kwuru na ha na-atụ anya na ihe a ha nyochapụtara ga-akpali mmụọ ụmụnwaanyị isi ojii ka ha na-enyocha onwe ha ugboro ugboro gbasara ọrịa a. Laverne Faunteroy nwaanyị isiojii dị afọ 53 bi na New York kwuru sị, “Enweghị mgbe o jiri baa m n’obi maọbụ ịchekasị uche maka nke a”. Laveren na-ebi ndụ gbadoro ụkwụ n’ahụike. Kama otechaghị aka o mere emume ncheta ọmụmụ ya ka o nwetara ozi na o nwere ọrịa kansa. O kwuru sị, “ụjọ tụrụ m n’ihi ndị niile m ma nwere ọrịa kansa ejighị isi ha pụta, obi dara m mba, ezigbo ụjọ jidere m”. Laveren chọpụtara na o nwere kansa ara nke a kpọrọ ‘Triple Negative’ (TNBC). Ndị mmadụ anaghị enwekaarị kansa nke a, ọ na-eto ngwa ngwa, ọ na-agbasakwa ngwa ngwa, ma na-esi ike ịgwọta. Ọrịa kansa nke a na-egbu ọtụtụ ndị mmadụ. Dịka etu ọrịa kansa nke a siri dị, ọgwụ eji agwọ kansa ndị ọzọ anaghị adị ire n'ebe ọ nọ. Ọ bụ ụmunwaanyị na-erubeghị afọ iri anọ (40) ka ọ na-emekaarị ma bụrụkwa ụmụnwaanyị isi ojii ka ọ kachasị arịa. Nyocha ngalaba JAMA oncology bipụtara chọpụtara na ọrịa a ji pasentị 28% egbu ụmụnwaanyị isi ojii karịa ụmu nwaanyị ndị ọcha nwere ya bụ ọrịa. Ugbua, nyocha ọzọ akwadola ya bụ mpụtara na-ekwu na e nwere ihe jịkọro agbụrụ ụmụnwaanyị  Afrịka na ọrịa kansa 'Triple Negative' (TNBC). Dọkịnta Lisa Newman bụ Weil Cornell Medicine onye so na nyocha ndị sayensị nke mbaụwa maka ọrịa kansa ara n’ụfọdụ mpghara n’Afrịka kamgbe afọ iri abụọ. Nyocha ya gosiri na ọ bụ ụmụnwaanyị si na mpaghara Ndịda Afrịka dịka mba Gana ka ọria kansa TNBC kachasị enye nsogbu. O kwuru na ọ nwereike ịbụ maka na ahụ ụmụnwaanyị ndị a agbanweela maka etu ahụ ha si ebuso ọrịa Malarịa agha. Newman kwuru sị, “ nyocha ọrịa kansa ara nke 'Triple Negative' na-egosi na agbụrụ mmadụ si metụtara etu ahụ onye ahụ si alụsọ ọrịa a ọgụ nke na-emetụta ụfọdụ akụku ahụ mmadụ dịka ara nwaanyị”. O kwukwara sị, “ ọrụ nchọpụta a na-akpalị mmụọ anyị n’ihi na ọ na-aza ajụjụ maka etu ọrịa si awakpo mmadụ site n’agbụrụ”. Ọ gara n’ihu kọwaa, “Ọ na-enyekwa anyị ezi nghọta maka ọrịa a”. Newman gbara ama sị,” Anyị na-ahụta oke agbụrụ gbasara ọrịa kansa dịka ngalaba ahụike na ndị na-elekọta ndị ọrịa anya anaghị ekwe eji ụmụnwaanyị ndị agbụrụ Afrịka eme nyocha maka ọrịa kansa dịka ha na-eji ndị ọcha eme”. Laverne kwenyere na ọ dị mkpa na ụmụnwaanyị agbụrụ Afrịka soro na nyocha ahụike maka ọrịa. O kwuru sị, “ Echere m na akụkọ anyị na mba Amerịka na etu e siri kpasoo anyị agwa oge gboo, na-egbochi anyị isonye n’ihe ọbụla” O kwuru sị, “ Achọrọ m iso na ndị ga-eme ka ihe dịrị ndị mmadụ mma n’ọdịnihu”. Laverne enweghịzị ọrịa kansa dịka awara ya ahụ n’ọnwa Julaị maka ọrịa a. “Ihe niile na-aga nke ọma... eji m ya eme ọnụ na m soro na nyocha a. Ma jiri kwa ya na-eme ọnụ na m nyeere Dọkịnta Newman aka maka nyocha ya”. Na mba Briten, ụmụnwaanyị agbụrụ Afrịka ji ugboro abụọ karịa ụmụnwaanyị ndị ọcha gbasara ịnyochapụta ọrịa kansa oge ọ nọ na ngwụcha ya. Ngalaba NHS nke agbụrụ na Health Observatory na-akpọku ụmụnwaanyị isiojii ka ha soro na nyocha a”. Dọkịnta Georgette Oni bụ dọkịnta na-awa ụmụnwaanyị ahụ maka ọrịa Kansa bi na Notthingham kwuru na ọ bụ ezigbo nsogbu na ụmunwaanyị isiojii anaghị eso na nyocha ahụike ndị a. O kwuru sị, “Ihe m na-ekwukaarị maka ya ọtụtụ mgbe bụ ka ụmụnwaanyị ndị isiojii soro na nyocha ndị a, n’ihi na ọ bụ ebe a ka e si edepụta mpụtara nyocha ndị a”. “Ọ bụ etu a ka e si achọpụta etu e si alụso ọrịa a ọgụ, nke a bụ nke metụtara gị dịka mmadụ n’ihi na ọ bụ ụmunwaanyị agbụrụ Afrịka ka ọ kachasị metụta”. O kpebiri sị, “Ọ bụ mgbe ọtụtụ ndị mmadụ soro mee nyocha ka mpụtara ya na-aba oke uru”. https://www.bbc.com/igbo/articles/cevgqzgxkzpo +entertainment Onye bụ Angela Nwosu a ndị mmadụ kpụ n'ọnụ? Angela Nwosu bụ nwaanyị a ma ama na soshal midia maka etu o si ekwu okwu nakwa ahịa ọ na-ere. Ọ bụ onye na-akwado ihe omenala, na-akpọ onwe ya Ogbanje, na-akụziri ndị mmadụ maka alụmdinanwunye ha ma bụrụkwa onye meburu ihe onyonyo. Ugbua ọ na-ewu ewu maka ebubo mmadụ boro ya gbasara nne ya a sị na ọ gbahapụrụ n'obodo ha. Nwosu sara ihe niile gbasara ọnụ ndị mmadụ na-akọ ya na mkparịtaụka nke ya na BBC nwere n'ụbọchị Wenzde. Mgbe BBC Igbo na Angela Nwosu nwere mkparịtaụka pụrụiche, ọ kọwara ọtụtụ ihe maka onwe ya. Lee ihe ndị BBC Igbo chọpụtara maka ya: https://www.bbc.com/igbo/afirika-58273091 +business Anambra steeti ga-enyocha ndị ji ya ụgwọ Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Ipob amapụtakwala ọzọ wegharịa udo nke ohaneze ndi Igbo na ndị gọvanọ na-achị mpaghara ọwụwa anyanwụ nwere. Ha kwuru na ọ bụ maka na ha enweghi ike ịkwụsị mmachi a machiri Ipob dịka otu na-eyi egwu. Naịjirịa Anambara steeti chịkwa ọkụ eso ndị chọrọ ịzọ ọchịchị na steeti ahụ, ha achọghị ndị anaghị atụ ụtụ isi cha cha. Steeti ahụ ekwuola na onye ọbụla chọrọ ịma akwụkwọ n'akụkụ ebe ọbụla iji chụ nta vootu ga-akwụ ụtụ so ya. Ebe ọzọ na Naịjirịa Ndị ụlọomeiwu ga-enwe nzụkọ ụbọchị Tuzde n'izu na-abịa maka bọjetị a chọrọ ịgbakwunye na nke 2018. Osote onyeisi ụlọ omeiwu nta bụ Yusuff Lasun kwuru nke a ụnyaahụ ka ndị otu ha nọ na pati APC mesịrị ọgbakọ nke otu PDP kwukwara na ha ga-esonye. Akụkọ mba ofesi Nọt kọrịya abarala Amerịka mba na ha ka na-enye ha ntaramahụhụ maka ngwọagha nuklia ha. Ha kwuru na ha agaghị akwụsị ime ngwọagha ahụ ma ha jiri ụdị aka ahụ nke ha kwuru na ndị na-eme mkparịtaụka gbasara ya anaghị eso ebumnobi Donald Trump. N'egwuregwu, N'egwuregwu, ndị n'ọchị ndị na akwa dịka e mechiri ohere ịzụrụ ndị ọgba bọọlụ n'asọmpi Premia Lig. Mana ndị ntorobịa ji ọnụ na-eche ya bụ asọmpi ga-amalite taa nke otu egwu bọọlụ Man United na Leicester City ga-ebido. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa: https://www.bbc.com/igbo/45109774 +entertainment Oriental Brothers: Maka na m bụ onyeisi, ha chere na m na-eri ego nanị m - Kabaka Oriental brothers wuru ewu mgbe elu bụ ala ọsa. ọ bụ ebe ha na-eti egwu ka ndị ụlọọrụ na arụ na ụlọegwu a na akpọ 'Afrodisia' hụrụ ha were jụọ ha ma ha a ga-etinwu egwu. Lee etu ha si bido na ihe butere mgbasa 'Oriental Brothers'. Ndị mere ihe nkiri a bụ Vining Ogu na Ikechukwu Kalu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51078948 +business Onitsha Fire: Peter obi, ụmụ gị na-ebe akwa - Ndị Onitsha Ndị na-azụ ahia na Ọchanja na ụpper Iweka na ekele Peter Obi dịka ọ biatara ha mgbaru maka ọkụ gbara ahịa ha. Obi kwuru na owepụtala nde naira abụọ iji dozie ebe ọkụ a metụtara. Ndịagha agbagbuola nwaanyị jị ụmụ aka ya dị ọcha Ụfọdụ ndị otu agha Naịjirịa egbuola ndị ha kwuru kparịrị ọyị nwaanyị otu onye n'ime ha. Anya hụrụ mgbe ihe a mere Nafiu Muhammad gwara BBC na ya bụ ihe mere n'elekere asọtọ n'ụma na mgbede na Mabera dị na Sokoto. Muhammad kwuru na okwu kawanyere njọ mgbe ndị otu Nigerian Airforce bidoro gbasasiwa egbe ka igwe mmadụ ghara ibiagbu ha. Nke a mere ka mgbọ egbe ntụsasi gbata ọtụ nwaanyị dị ime ma mụgọro ụmụ asaa nakwa otu okorobia ma gbuo ha. Ndị okenye kwuru na ha ga-enyocha ozu ahụ ka ha matakwuo ka ha si nwụọ tupu ha nie ha. Nwoke a sị na o gburu ụmụnwaanyị itolu na Pọtakụt an n'ebe ndị ọzọ nọrọ n'ụlo ikpe taa si 'Eee egburu m ụmu nwanyi itolu a'. Nwoke a aha ya bụ David West ga anọ n'ụlọmkpọrọ na pọtakụt tutu ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Novemba afọ a mgbe a ga-ebido ikpe ya n'ụjụ. Dịka achụpụru Simon Achụba dịka osote Gọvanọ Kogi steeti , ọ kpọro ndị Nkaakụko gwa ha na na-agbanyeghị na ọ ka bụ kwa Osote Gọvanọ Kogi steeti. Achuba kwuru na anapụrụ ya ụgbọala ya ma wepụ ọkụ ;atrik n'office ya. O kwukwara na mwepụ ya ezighị ezi ma na ọ ga-aga ụlo ikpe maka nke a. O kwuru na ihe emere ya bụ ihe ihere na mkpari nye ndị Kogi steeti niile. Messi ọ ga-amabụrụ Ballon D'or nke afọ 2019 Lionel Messi nwere ike ituru ugo ọzọ dịka ọkacha agba bọọlụ n'ụwa niile. Aha ya so na ndị ahọpụtara maka inweta nturuugo 'Ballon D'or' nke afọ 2019. Cheta na ọbụ Messi ka e chiri eze bọọlụ nke ndị otu na-elekọta egwuruegwu bọọlụ bụ Fifa. Ndị ọzọ aha ha so na ndị a na-atule maka nturuugo ahụ bụ Cristiano Ronaldo na Virgil Van Dijk. Ronaldo na-agbara otu egwu bọọlụ Juventus nakwa mba Pọtụgal ebe Van Dijk na-agbara ndị Liverpool nakwa mba Nedalands. Luca Modric, onye otu egwu bọọlụ Real Madrid, bụ onye tuuru ugo 'Ballon D'or' nke afọ gara aga. Mana aha ya esoghị chaachaa na ndị nwere ike irite nke afọ a. Nwaafọ Igbo bu Samuel Chukwueze sokwa na mmadụ iri ahọpụtara aha ha dịka ndị ntorobịa kacha agba bọọlụ n'ụwa. Na abalị abụọ nke ọnwa Disemba ka a ga-ekwupụta onye tuuru ugo 'Ballon d'or' nke afọ 2019. Ụlọikpe dị n'Abuja ekwugharịala ihe Omoyele Sowore ga-eme tupu atọhapụ ya na nga ndị DSS ebe e ji ya kamgbe ọnwa Ọgọst. Ụlọikpe ahụ kwuburu na onye ọbụla ga-agbara Sowore akaebe tupu atọhapụ ya ga-akwụ nde naịra iri ise, mana ugbua ha akụchapụla nke ahụ. Mana ụlọikpe kwụsịrị ike na mkpebi ya na Sowore agaghị esi Abuja pụọ ma a tọhapụ ya. Uloikpe ahụ butukwara ego ha kwuru na Olawale Baka re ga-akwụ tupu a tọhapụ ya. Bakare bụ onye a nwụchiri ya na Sowore otu oge. A na-ebo ha abụọ ebubo na ha kparịrị onyeisiala Muhammadu Buhari ma na-achọkwa ụzọ ịchutu ya n'ọkwa. Na nke dịka ibe ya, dịka ụlọikpe na Legọs nyere iwu ka gọọmentị etiti weghara ụlọ Bukola Saraki, Saraki na-ekwu na egwu ọbụla adịghị atụ ya. Saraki kwuru na ọbụ nghọgbu ka ndị EFCC ghọgburu ụlọikpe ahụ n'ihi na ụlọikpe kachasị na Naịjirịa ekwubuola na aka ya dị ọcha. O kwuru na ya agwala ndị ọkaiwu ya ka ha ga gbaghaa iwu ahụ ụlọikpe Legọs nyere na mgbede Monde. A na atụ anya na otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke onyeisiala mba Canada bụ Justin Trudeau ga-eturu ugo na ntuliaka nke na aga n'ihu na mba ahụ ugbua. Mana Trudeau ga achọ enyemaka ndị patị nke ọzọ n'ihi na pati ya enwezuchaghị vote ole a tụrụ anya n'aka ha. Onyeisiala Turkey bụ recep Erdogan abaala mba na ha ga-ebido ịluso ndi Kurd bi na Syria agha ma ọ bụrụ na ha esighị na oke jikọro ha abụọ pụọ. Erdogan kwusiri ibuso ha agha izuụka gaara aga mgbe ndị Amerịka kpọro ya ka enwee mkparịta ụka. Naijirịa na mba Ijipt ga anọchịte anya Afrịka n'iko asọmpi Table Tennis a ga-asọ na Japan na Nọvemba afọ a. Ọ bụ Aruna Quadri, Olajide Omotayo, Bode Abiodun na Azeez Solanke ga-anọchite anya Naijirịa na-asọmpi a. Arsenal ndị ọnyụpa E lelịa nwa ite ọ gbọnyụọ ọkụ. Otu a ka ndị egwu bọọlụ Sheffield United si were otu ọkpụ goolu dulaa ndị Arsenal na abalị Mọnde. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50136581 +business 63% pasentị ndị Naịjirịa bi n'ime ụbịam - Gọọmentị Naịjirịa Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka ngụkọ bụ 'National Bureau of Statistics' na-ekwu na pasentị iri isii na atọ ndị niile bi na Naịjirịa dara ụbịam. Nke a bụ ihe dị n'ime akwụkwọ nnyocha a kpọrọ '2022 Multidimesional Poverty Index' (MPI), nke ngalaba NBS wepụtara n'ụbọchị taa bụ Tọzde, Nọvemba 17 2022. Nnyocha sitere n'ijikọ aka nke ngalaba NBS, 'National Social Safety-Nets Coordinating Office (NASSCO), United Nations Development Programme (UNDP), United Nations Children Fund (UNICEF) na Ozford Poverty and Human Development Initiative (OPHI). Ezinụlọ puku iri ise na isii bi na steeti niile dị na Naịjirịa nakwa Abuja ka a jụrụ ajụjụ ọnụ malite n'ọnwa Nọvemba 2021 ruo ọnwa Febrụwarị 2022 iji nweta mpụtara nnyocha a. Dịka mpụtara nnyocha nke ngala NBS mere si gosi: https://www.bbc.com/igbo/articles/c0419z782ego +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Serena Williams awakela ọzọ Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Serena Williams awakela ka anyanwụ ọzọ Agbara nwaanyị na egwuruegwu tennis bụ Serena Williams sị ụwa chere aka ghọrọ ya na ọdịnihụ. Serena bụ onye meriri Ashleigh Barty nke mba Australia sị na ya ga-emecha sịe ike karịa ka ya dị bụ tupu ya amụọ nwa bụ nke sechituru ya nwaazụ na-egwu. Achọrọ Owelle Rochas achọ na ọgbakọ ndị APC n'Abụja ụnyahụ ebe ọtụtụ ndị isi ọzọ ndị pati ahụ zuru na ya bụ ọgbakọ Owelle sị na ya bụ ọgbakọ ezughi oke ma ya bụ onyeisi pati ahụ na ọwụwa anyanwụ a nọghị ya. Cheta na Rochas na ndị pati ya malitere ịnwe ọgbaghara nsonso a. Boko Haram agbuola ndịagha ise na Boronu Na Boronu steeti unyahụ, ndị Boko Haram wakporo ma ta isi ndị agha Naịjirịa ise. Texas Chukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa kwuputara nke a mgbe ọ sị na ndị omekaome a basara ndị agha operation Lafia dole ọgụ mgbe ihe a mere. Nkatọ esochiela mbuli ụtụisi ngwa ahịa igwe Trump Nkatọ esochiele ụtụisi nke onyeisiala Trump nke Amerịka tinyere na-azụm ahịa igwe ndị mba ọzọ. Trump weliri ụtụisi ngwa ahịa na-aka mba EU, Canada na Mexico bụ ndị fooro ntutu ta na ha ga abọrọ mbọ. Ihe nkiri nke taa: https://www.bbc.com/igbo/afirika-44328328 +business Chinmark Group: Etu ndị ego tọrọ na Chinmark si degara onyeisi uweojii Naijiria akwụkwọ mkpesa "Ndị ego ha tọrọ n'aka ụlọọrụ Chinmark Group nke Marksman Chinedu Ijiomah hiwere edegarala onyeisi uweojii Naijiria bụ Usman Alkali Baba akwụkwọ mkpesa. Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ebo ebubo na Marksman Chinedu Ijiomah ji ụlọọrụ ya bụ Chinmark Group napụ ọtụtụ ụmụ Naijiria ego n'ụzọ aghụghọ, gbalaga. Ọ bụ ụlọ ọkaiwu 'Relief Law Chambers' dị na Pọtakọt zigaara onyeisi ndị uweojii akwụkwọ mkpesa a n'ụbọchị 25 nke ọnwa Maachị afọ 2022, n'aha ndị tinyere ego ha n'ụlọọrụ Chinmark Chinmark Group. N'akwụkwọ mkpesa a, ha na-ebo Ijioma na ndị ọzọ ebubo igwu ha chadum ego dị ijeri Nairia iri abụọ. Onyeisi ụlọọrụ 'Relief Law Chambers' bụ Ọkaiwu Clinton Biragbara gwara BBc Igbo n'ekwenti na ha degara onyeisi ndị uweojii akwụkwọ mkpesa ahụ n'eziokwu. Mana o kweghị enye anyị nkọwa miri emi gbasara ya n'ihi na ""anyị achọghị ịgba n'anwụ ụzọ anyị chọrọ iji nweta ikpe nkwụmọtọ"". BBC Igbo nwetara akwụkwọ mkpesa ahụ nke kwuru na Marksman Chnedu Ijioma na ndị otu ya ji aha ụlọọrụ dị icheiche wee napụ ha akatamkpo ego. Aha ụlọọrụ ndị a gụnyere: Chinmark Homes And Shelters, na Chinmark Suites and Resident Ltd. Ndị ha kpọrọ aha so tinye aka napụ ha ego n'aghụghọ n'aha Chinmark Group bụ Amanda Chisom, Harrison Gwamnishu, Ezinne Azu, Chima Fortune nakwa Sharon Ubani. Ndị ọzọ gụnyere; Madu MaryJane-Ogechi, Loveth Nwizu,Adaobi Okorie, Eby Amada Pius Urum bụ ndị Chinmark ji were dọta ọtụtụ ndị mmadụ. Ha boro ebubo na Ijiomah na ndị otu ya ji ire ụtọ napụta ha ego ndị a ma kwe ha nkwa iwu ogige ụlọ obibi (Estate) ha ga-enwekọrịta, tinye ndị mmadụ ma na-anakọta ụgwọ ụlọ. Akwụkwọ mkpesa ahụ sị, ""Ndị sị ka anyị nọchite ha kwunyere ego dị iche iche n'aka ndị a a na-enyo enyo, chee na ha na-akwụ ụgwọ ụlọ dịka ndị nwetara oke na Chinmark Estate."" ""Chinmark jụrụ imejupụta nkwa ha kwere inye ndị anyị na-anọchite bụ ndị ha duhiechara, ghọrịa sị na ha bụ ụlọọrụ na-ewu ụlọ, dịka ha kwunyechara ego n'ọbaego ha."" Ha gara n'ihu bekuo onyeisi Uweojii ka ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ gbatara ha ọsọ enyemaka site na inyọcha Ijiomah na ndị otu ya bụ ndị ha boro ebubo ịchọ ịgabapụ na Naijiria. Cheta na BBC Igbo na Chinedu Marksman Ijiomah nwere mkparịtaụka n'ọdị nso a ebe ọ nọrọ kwuo na ọ bụghị eziokwu na ya na-achọ ịgba ọsọ pụọ na Naịjirịa. O kwuru na ya ga-akwụ ndị mmadụ ụgwọ ha ma ha nye ya ohere ọnwa asaa. N' aka nke ọzọ Amanda Chisom, onye e ji ihu ya reere 'Chinmark Investment' ahịa gwara BBC Igbo na ya chere na ihe ọ na-eme kwụ ọtọ nke mere ya ji gwa ndị mmadụ ka ha tinye ego ha. Ọ gara n'ihu kwuọ na ebe ọ kwụ ugbua bụ ịhụ na ọ gbara mbọ etu ike ya ruru, ịhụ na ndị mmadụ nwetara ego ha.. Harrison Gwamnishu n'onwe ya kwuru na ""O nweghị onye ọbụla m kpụrụ n'aka ka o tinye ego ya n'ụlọọrụ Chinmark,"" kama ha hụrụ ""ihe Chinmark nwere n'ebe dị icheiche ga-enwe mmasị itinye ego ya n'ụlọọrụ ahụ."" Otu onye ọrụ na-arụrụ Marksman Chinedu Ijiomah bụ onyeisi Chinmark Group , na-achọghị ka-akpọ aha ya ekwuola ihe ha na-agabiga ugbua n'aka nwa amadi ya ugbua. Chinmark na-ewu kamgbe na soshal midia maka etu ndị mmadụ si pụta na-ekwu na o kweghị akwụ ha ụgwọ o ji ha dịka ụfọdụ n'ime ha tinyere ego ha n'ụọahịa ya iji nweta isi ego na ọmụrụ nwa. Onye ahụ kwuru na kamgbe mbido afọ 2022 ka ya na ndị ọzọ na-arụrụ Chinmark ọrụ bidoro hụwa mgbanwe agwa n'ebe Ijiomah nọ. N'ọnụ, onyeisi anyị kwụsịrị iza ekwenti ya ma anyị kpọọ ya, anaghị ekwe ka anyị bata n'ime ogige ụlọọrụ Chinmark kamgbe mbido afọ 2022. O kwuru na nya bụ ihe gbagojuru ha anya makana o gosila anyị ọtụtụ ihunanya tupu ugbua. Onye ọrụ ya ọzọ kwuru na o bidoro rụwara Chinmark Group ọrụ n'afọ 2020, mana eruru nq mbido afọ 2022, ndị isi ụlọọrụ ahụ kpọọ ya na ụfọdụ ndị otu ya, si ha kwụsị ọrụ. Ọ gwara BBC Igbo na ihe ụlọọrụ Chinmark gwara ha bụ na ha na-aga obere ezumike nakwa ha ga-akpọghachite ha n'oge na-adịghị anya.- Ọtụtụ mmadụ pụtara n'elu soshal midia na-ekwu etu Ijiomah si gwuo ha chandum site na ịnakọrọ ha ego ha ma jụụ ikwụ ha ụgwọ mgbe o kwere nkwa ịkwụ ya bụ ụgwọ. Ihe ndị mere ụwa ji kpụrụ Chinmark Group n'ọnụ ugbua Cheta na Marksman Chinedu Ijiomah eji Chinmark wee mara pụtara n'onyonyo o tinyere n'akara Facebook rịọ ndị oji ego achụ ego dọnyere ụloahịa ya ukwu ka ha nwee ndịdị nwa mgbe nta. Arịrịọ Chinmark na-abịa n'elu okwu pụtara na social media ebe ọtụtụ mmadụ kwuru na o ji ha ụgwọ dịka ha tinyere ego ha n'ụlọahịa ya, iji chụta uru n'elu ego ha. Chinmark Group bụ aha e ji mara ngalaba nwa amadi Ijomah nke o hibere iji nye ndị mmadụ ohere ka ha wete ego ka o jiri ya na-azụ ahịa ma na-enye ha ọmụrụ nwa n'elu ego ha, dịka Ijomah si depụta n'akara Faecbook ya. Kedụ ka mmiri si gbaruọ? Marksman Chinedu Ijomah depụtara n'akara facebook ya, na ngalaba Securities & Exchange Commission (SEC) machiri ọba ego Chinmarks Group kamgbe ụbọchị December 21, 2021. O kwuru na kamgbe ahụ, na ọ bụ sọ mmadụ narị ise n'ime mmadụ pụku anọ na ụma (4966) ka ọ kwụnwụrụ ụgwọ ha tinyere na nwulite ụlọahịa Chinmark iji rite ọmụrụ nwa ego malite na March 16, 2022. Mana ụfọdụ ndị mmadụ tinyere ego na Chinmark na-ekwusike na Ijomah egwuola ha chandum site na ịji ndị otimkpu ya lafuo ha ma nakọrọ ha ego ha. Otimkpu Chinmark ụwa kpụ n'ọnụ ugbua bụ Amanda Chisom bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta mmadụ na ọha nakwa Harrison Gwamnishu bụkwa onye ọnụ na-eru n'okwu. Naanị Amanda ka anyị hurụ ihe gbasara Chinmark n'akara Facebook ya mana onwebeghị ihe anyị hụrụ Gwamnishu depụtara maka Chinmark n'akara Facebook ya. Lee ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu maka Amanda Chisom bụ otimkpu Chinmark: Ngalaba Securities & Exchange Commission (SEC) nke Naịjirịa depụtara n'ọba ozi webụsaiti ha akwụkwọ ozi katọrọ atụmaatụ oji ego achụ ego nke ụlọahịa Chinmark Group. Akwụkwọ ozi ahụ bu deeti December 25, 2021 dọrọ ndị mmadụ aka na nti ka ha mata na Chinmark group nke nọ n'okpuru aha Fin Africa Investment Limited edenyeghị aha azụmahia ya n'akwụkwọ SEC ma na-ekwu na onye ọbụla ya na ha na-emekọ ihe , ihe ọ hụru ya jiri isi ya buru. Akwụkwọ ozi ahụ kwukwara na SEC akwadoghị udiri atụmaatụ azụmahia Chinmark na-eme. Agbanyeghị mmiri ọkụ a niile na-asụ maka okwu a, Ijiomah apụtala na-ekwusi ike na onweghị ihe mere ego niile o ji ndị mmadụ nakwa ọ na-agba mbọ ihu na onye ọbụla nwetere ego ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60837201 +politics Insecurity in Nigeria: Amaghị m ma ndị gọvanọ anyị ọ na-atụ ụjọ - Pete Edochie "Pete Edochie bụ onye nkiri ama ama e nyela ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ndụmọdụ etu ha ga-esi wulite mpaghara ahụ. O kwukwara na ọ ga-adị mma ma ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ tịkọọ aka ọnụ iji gboo mkpa na-akpa ndị Igbo. N'okwu ya, ""ọ bụ onye kwuputere maka ọkọ na-akọ ya ka a na-ege ntị."" Lee ihe o kwuru n'uju n'ihe nkiri a dị ebe a." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56884461 +entertainment Chimamanda Adichie's Americanah: Gịnị ka Naịjirịa na Kenya na-azọ? "Naịjirịa na Kenya bụkwa otu nna akpọrọ 'Afrịka' mụrụ ha mana ọdịka akwụkwọ ""Americanah"" nwa ada Igbo bụ Chimamanda Adiche akpariela ndọrọndọrọ n'etiti ha. Ha abụọ nọ na soshal midịa na-ekwusi ike maka etu Lupita Nyongo bụ onye Kenya sị chọọ ịkpa agwa ka onye Igbo n'ihe nkiri a ga-eji akwụkwọ ahụ wee mepụta. Chimamanda Adiche dere Amerịcanah n'afọ 2013. Lupita gotere ohere ijiri akwụkwọ mee ihe nkiri n'afọ 2018. Mgbe ahụ, Chimamanda kwuru na aka ya agaghị adị n'atụmatụ etu ihe nkiri esi akwụkwọ mepụta. Mana, ọ sịkwa na ya ga-agba mbọ hụ na enwetere asụsụ Igbo ọfụma na ya bụ ihe nkiri. Nke pụtara na o nwereike nye aka hụ na Lupita mere nke ọma na ya bụ ihe nkiri. Kemgbe WarnerMedia's kwuputechara ya, ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia na-ekwesịghị ị nye Nyongo ohere ịkpa agwa ka onye Naịjirịa n'ihe nkiri Americanah makana o nweghị ire ndị mba ahụ. @Duke Edoho dere na twitter na ọ bụrụ na Nyongo kpa agwa dịka onye Igbo n'ihe nkiri a, ọgaghị atọcha ụtọ. Onye ọzọ kwukwara, ""anyị nwere ụmụnwaanyị na-eme ihe nkiri ọfụma na Naịjirịa ga-akpali agwa ahụ nkeọma"". Mana ndị Kenya nọ na twitter kwuchitere nwanne ha ọnụ na-ekwu na onweghị onye Nyongo nọchịrị ụzọ makana ọ bụ ọkaibe n'ihe nkiri. Ụfọdụ chetara ụmụ Naịjirịa na ọ bụ ndagwụrụgwu ọwụwa anyanwu Afrịka kpalitere mmuọ Beyonce ma kwalite ihe nkiri ya akpọrọ 'Lion King'. Akụkọ ndị ga-amasị gị" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49705857 +business 'National Grid' dara, kulie, gịnị ka ọ pụtara? "Ụnyaahụ bụ wenezde, ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Julaị ka gọọmentị Naịjirịa kwuru na ""National Grid"" dara nke ugboro isii ya kemgbe Jenụwarị 2022. Nke a gbagwojuru ndị mmadụ anya, mere ụfọdụ ji ajụ ajụjụ sị, ""kedụ ka 'national grid' ga-esi daa n'ụtụtụ kulie n'abalị? Onye ọkachamara n'ihe gbasara okwu ọkụ latrik bụ Ilo Faustinus Chinedu kọwara na ""ọbụghị igweọkụ na-ada"". Ọ sị na ọ bụ ọkụ gwụrụ n'aka ndị na-arụpụta ya bụ Generation Company of Nigeria, GenCos, maọbụ na ndị na-ego ọkụ bụ ndị Disco enweghị ego ha ji egozụ ọkụ. Ilo kwuru na ihe mere ọkụ ji agwụ n'aka ndị GenCos dị ọtụtụ. Nke mbụ bụ na ndị na-ere ọkụ bụ Distribution Companies of Nigeria, Discos, anaghị eretezu ego ọkụ a na-ego maka ndị ohi ọkụ na mpụ na aghụghọ dị n'ọrụ ọkụ. Ilo sị na ọ bụ ụzọ abụọ ka gọọmentị si enwete ọkụ ha na-ekesa. Mbụ bụ site na mmiri nke Bekee kpọrọ 'Hydro electricity'. Abụọ bụru site n'igweọkụ n'eri gasị. Ọ bụrụ na enweghị gasị ebe o zuruoke na mgbe a chọrọ ya, ọkụ agaghị adị. Ọ bụrụkwanụ na-enweghị mmiri n'uju na Kanji dam bụ ebe a na-arụpụta ọkụ, ọkụ agaghị adị. Ọ bụrukwanụ na-enweta ọkụ ndị mmadụ zuchaa ya n'ohi, ndị na-ekesa ọkụ bụ Discos agaghị enwe ego ha ji egote ọkụ ọzọ. N'ụdị a, ọbụrụgodị n'ọkụ jụ ebe a na-arụpụta ya, ndị Disco agaghị enwe ego ha ji egota ya bụ ọkụ. Ọzọ, ọbụrụ na ndị mmadụ zụọ akụrụngwa waya maọbụ igweọkụ maọbụ ihe ndị ọzọ e ji esesa ọkụ, ọkụ agaghị adị. Ilo sị na ihe mere ndị mmadị ji ezu ohi ọkụ maọbụ zuru akarụngwa ọkụ ree bụ na ha ka na-ahụta ọkụ ka uru ha kwesiri irita na gọọmentị. Ọ sị na oge nke ahụ agaala maka gọọmentị ereela ụlọọrụ na-emepụta ya bụ okụ. ""ndị mmadụ anaghị ahụ uru dị n'igwụ ụgwọ ọku. Mana ọkụ abụghịzị 'national cake a na-eke ghara ịkwụ ụgwọ"". Ọ sị na ugbua, onye ọbụla na-atazị ahụhụ ohi ọkụ a ụfọdụ na-ezu"". Ọ sị na ihe ọzọ na-eme ka ndị mmadụ ghara ịgwụ ụgwọ ọkụ bụ oke 'bill' a na-ezitere ha. Ọ kọwara na ọ bụrụ na ndị mmadụ ahụghị ọkụ ruru ego ha na-akwụ, na ha agaghịzị akwụ ụgwọ ọzọ. Nke atọ bụ ndị mmadụ enweghị ezi nghọta maka uru ọ bara ịgwụ ụgwọ ọkụ. Na ""ọ bụrụ na ndị mmadụ hụ ka ụgwọọkụ na mmepe obodo siri jikọta, ha ga akwụ ụgwọọkụ"". Ilo kwukwara na ọ nwere ndị ajọ mmadụ nwere ya bụ izu ohi ọkụ dịka akaọrụ, naọ nweghị ihe emere ka ha nghara izu ọkụ. Na ndị dị otu a mwere ndị Disco anaghị eretezu ego ọkụ ha iji gote ọkụ ọzọ n'aka ndị GenCo. GenCo kọwara na ụbọchị Wenezde na ọkụ tipịara site 300MW ruo 40 MW site n'ehihie ruo n'abalị." https://www.bbc.com/igbo/articles/ce9j1762em8o +sports Iker Casillas bụbụ oche goolu Real madrid awụsala ọwa n'afọ 39 "Iker Casilas awụsala ọwa n'egwu bọọlụ n'afọ iri atọ na itoolu. O cherela Real Madrid goolu ugboro narị asaa na iri abụọ na ise (725) n'ime afọ iri na isii (16) ya na ha nọ na Santiago Bernabeu. O ritere iko Champions League ruru atọ na nke La Liga ruru ise. O nyere mba Spain aka rite iko mba ụwa nke 2010 nakwa ""European Championships"" ugboro abụọ n'afọ 2008 nakwa 2012. Casillas sonyere egwu bọọlụ Porto n'afọ 2015 mana ọ gbabeghị bọọlụ kamgbe April nke afọ 2019 maka nkoropu obi mere ya mgbe ọ na-eme ọzụzụ. Mgbe ọ na-agbake, e nyere ya ọkwa n'ogo ndị nchịkọta otu bọọlụ ahụ na Julai nke afọ 2019. Casillas agbarala ndị Porto bọọlụ ugboro 156 , merie ọkwa Primeira Liga ugboro abụọ nakwa iko Portuguese. O gbara ndị mba Spain bọọlụ ugboro 167 site na 2000 ruo afọ 2016. Sergio Ramos bu onye ọgba bọọlụ ibe ya na Spain ka ya gbara mba ahụ bọọlụ ugboro ugboro. O depụtara nwụsa ọwa ya na twitter ma si ihe kacha mkpa n'ụwa bụ njem ị gara na ndị so gị wee mee ya na abụghị ebe njem ahụ dụgara gị. Real Madrid bụ otu egwuregwu e ji mara Casillas kwuru na o sonyere ha mgbe ọ dị afọ itoolu ma bụrụkwa ọkaibe na oche goolu ha kamgbe afọ 118 otu egwuregwu ahụ malitere. Onye otu ya na Real Madrid bụ Sergio Ramos wepụtara ya na Casillas sere n'elu twitter iji we kele ọyị ya. N'ọnwa February, ka o gosiri mmasị ya ịzọ ọkwa onyeisioche Spanish Football Federation (RFEF) mana o mechara sere isi ya maka nsogbu Covid-19 butere na mba ahụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53653780 +politics Akụkọ kachasị n'abalị a: Donald Trump na Kim Jong-un agahizi enwe nzụkọ Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Abụbọ ọrụ ndị ọrụ ahụike ka na-aga n'ihu ebe ha na-aga n'ụlọọgwụ ịhụ na ndị otu ha na-esonyekwa. Naịjirịa Jega ga-ekwu okwu gbasara ọchịchị onye kwuo uche ya ụbọchị mmemme ncheta ya. Onye bụbu onyeisi ụlọọrụ INEC ma bụrụkwa onye mere ntuliaka 2015 bụ Atahiru Jega ga-ekwu okwu ụbọchị ncheta mbido ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa. Ụlọọrụ mgbasaozi gọọmenti etiti kwuru na Jega ga-ekwu okwu n'ọgbakọ a ga-eme maka ya bụ mmemme ụbọchị Mee 29. Akụkọ mba ofesi Ọgbakọ Trump na Kim Jong-un akpụọla afọ n'ala Ọgbakọ ụwa niile na-ele anya na Amerịka na Nọt Koria ga-eme agaghizi eme Nke a bụ maka na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọgbakọ ahụ agaghị eme maka iwe na ajọ agwa ndị Nọt Koriya kpasoro ha. Nke a niile na-eme dịka ndị Nọta koriya mebiri ebe ha na-emepụta ngwọagha nuklia taa. Nọt Koriya nabatara ọtụtụ ndị ntaakụkọ si mba Briten, China, Russia, Sawụtụ Koriya na US ịbịa hụ ka ndị ọrụ ha na-emebi ma na-emechi ebe ha si emepụta ngwọagha ahụ. N'egwuregwu, Andres Iniesta bụ onye si Barcelona pụọ na ngwụcha afọ a etinyela isi na Japan dịka o tinyela aka n'akwụkwọ ndị otu egwuregwu Vissel Kobe nke mba ahụ. ọ zaghị oku ndị otu egwu bọọlụ ndị ọzọ kpọrọ ya kamgbe ọ hapụrụ Barcelona. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa: https://www.bbc.com/igbo/44245095 +business "Enugu Airport: A ga-ewepụ ""International"" na Akanu Ibiam Airport?" Maka Akun Ibiam Airport Enugwu, Gọọmentị Enugu steeti emechiela ahịa Orie Emene na ọdụanụ dịketere ọdọugboelu Akanu Ibiam International Airport dị n'Emena. Nke a mere ka Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN) dọchara aka na ntị na ha nwere ike imechi ya bụ Ọdọugbọelụ maka ọnọdụ nchekwa ya. Mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara mbata na mfepụ ụgbọlelu Naịjirịa bụ Hadi Sirika ekwuola na gọọmenti etiti nwereike ịkwụsị mfepụ na mbata ụgbọelu si mba ofesi n'ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugu. O kwuru na ọ bụ maka ihe ndị ekwesiri ịrụzi ebe ahụ ana-arụbeghị nwereike ibute ọdachị. Gọọmenti Enugwu steeti amapụtakwala ego a ga-eji bugherie Orie Emene. Ndị uweojii n'Anambra steeti adọọla ọhaneze aka na ntị maka enyị amaghị ama a na-emeta na facebook. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru nke a mgbe ha zọrọ ndụ otu nwoke ndị omekome tọọrọ n'Ogidi, okpuruọchịchị Idemili North. N'ofesi e, Minista mba Austria bụ Heinz-Christian Strache agbaala arụkwaghị maka ebubo ngarị eboro ya. Ebubo ahụ kwuru na ahụrụ Strache ebe ya na onye mba Russia na ekwe ọnụ ihe ọ ga-akwụ ya ma ọ nyere ya aka merie ntuliaka na-abịanụ na abalị iri abụọ na isii nke onwe Mee a. N'egwuruegwu ekpuwele Bayern Munich okpueze nke Bundusliga nke ugboro asaa taa mgbe ha ndị Eintracht Frankfurt kwakọrịtara mkpị n'agba nke ikeazụ ehihie Satọde. Bayern ji ọkpụ ise chara acha asatara otu were napụ Frankfurt ya bụ iko ma rọọ ya anya nkarị. Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo akọọwala Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha dịka onye etu o si eme ihe na-agbagọjụ anya. O kwuru na ọ bụ makana ọ naghị eme nkpọtụ iji gosi iheọma omerela ndị Imo steeti kamgbe afọ asatọ ọ chịgoro steeti ahụ. O kwuru nke a mgbe ọ gara ịmepe ụfọdụ ihe ndị Rochas rụrụ ndị Imo steeti. Mba Australia atụwala vootu ha taa bụ ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa May . Na mba ahụ ọ bụ iwu na ị ga-atụrịrị vootu .Ihe karịrị mmadụ nde iri na isii denyere aha n'akwụkwọ maka ịtụ vootu. Agba nke ikpeazụ nke iko FA ga-adị kpọkpọ dịka Mancity ga-ezute Waford n'ama egwuregwu Wembley n'elekere ise nke mgbede taa. Mancity mabute iko nke a, ọ ga-eme ya iko atọ ha mabuterela n'izu egwuregwu a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48319451 +health Retrograde Ejaculation: 'Ọrịa shuga gbochiri m ịnyụpụta 'sperm' ma mụ na nwunye m nwee mmekọ' Otu nwoke akwaala arịrị maka enweghi ike anyụpụtanwu uhe (sperm) n'oge mmekọ ya na nwunye ya n'ihi ọrịa shuga. Nwoke sị na uhie anaghị apụta ya n'ahụ ma ya na nwaanyị dinaa kama na ọ chọpụtaghị ruo mgbe ọ lụrụ nwaanyị. Ọ sị na ọ bụ nwunye sịrị ya na ọ dịghị ya ka o nwere uhe ọ nyụbara n'ahụ mgbe ha nwere mmekọ. Na nke a mere o jiri gaa gbọọ ncha ma chọpụta na onweghi uhe ọbụla ọ na-anyụpụta n'ahụ ya. Ọ sị na ọ gaara ụlọọgwụ e mee nyocha dị iche iche ma chọpụta na o bu ọrịa shuga nke ọjọọ ya. Kirie ihe ọ sị na ọ gabigara n'uju. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58428116 +health "Breast Cancer: ""Amaghị m na onye dị afọ iri abụọ nwere ike ịrịa ọrịa kansa""" "Mgbe Lucy chọpụtara akpụ n'ara ya,o cheghịdị echiche na ọ bụ ọrịa kansa. Ọzọkwa, nchọpụta nke akpụ ara bụrụ ya ""ihe mberede."" Ọ naghị emekarị nnyocha ara ya mgbe niile. Mgbe ọ hụchara dọkịta, Lucy nwetara akụkọ ọjọọ na o nwere ọrịa kansa ara. Lucy dị afọ 26, gwara onye ntaakụkọ BBC bụ Kirsty Grant, na ""Echere m na m nwere ike ịmalite ime nke a mgbe m dị afọ 50"". N'ọnwa Septemba 5, 2021, onye bụbu onye egwu Britain ""Song Girl"" Sarah Harding nwụrụ n'ihi ọrịa kansa mgbe ọ dị afọ 39. Mgbe akụkọ ahụ pụtara n'akwụkwọ akụkọ, ọnụego pịa nke webụsaịtị nke ọrụ ebere ọrịa kansa ara Britain CoppaFeel mụbara nke ukwuu. N'ime awa iri na abụọ ka Sarah nwụsịrị, mmadụ 200,000 gara na websaịtị ahụ, mmụba nke okpukpu asatọ nke okporo ụzọ a na -emebu. CoppaFeel gwara BBC na n'agbanyeghị na ọrịa ara bụ ọrịa kansa kachasị n'etiti ụmụ nwanyị gbara afọ 25-49, otu ụzọ n'ụzọ anọ nke ndị na-eto eto amaghị na ọrịa ara na-emetụta ha; ụmụ agbọghọ bụkwa ndị mmadụ nwere ike gbuo oge ịhụ dọkịta. ""Dọkịta ahụ gbachiri nkịtị."" Nchọpụta Lucy chọpụtara akpụ akpụ ara bụ ihe mberede. Ọ dabara na ọ nọ na -ezu ike n'ụbọchị ahụ wee nwee ohere ịhụ dọkịta. Ọ sịrị, ""Anọ m na -eche maka ya, obi dị m ụtọ na enwere m izu ike n'ụbọchị ahụ. Ọbụlagodi mgbe dọkịta rịọrọ Lucy ka ọ nyefee ya n'ụlọ ọgwụ ara, ọ ka echeghị gbasara ọrịa ara. Mana nwanne m nwanyị siri ọnwụ na a ga -ahapụ ya ka ọ gaa nyocha ultrasound. Mgbe ahụ, Lucy malitere ịghọta ịdị njọ nke nsogbu ahụ. ""Dọkịta ahụ gbachiri nkịtị,"" ka o kwuru. Otu izu ka e mesịrị, a gwara Lucy na ọ bụ ọrịa kansa. N'oge na -adịghị anya, mkpụrụ ndụ kansa ahụ na -agbasa ruo n'ọkpụkpụ lymph. Dọkịta ahụ gwara Lucy na ọ chọrọ kemoterapi, radiotherapy na ịwa ahụ. Ọ sịrị, ""Mgbe ụfọdụ anaghị m enwe ike iri nri ma ọ bụ hie ụra."" Mgbe ụfọdụ enweghị m ike ịrahụ ụra awa iri abụọ n'ụbọchị, dina n'ihe ndina, enweghịkwa m ike imegharị ahụ. ""Anọ m na -ele anya nke ukwuu, akpụkpọ ahụ m dịkwa egwu. Etufuru m ntutu m, na ntutu m niile, gụnyere nku anya na nku anya."" Mgbe a wasịrị ya ahụ na ịwa ahụ ọkụ, Lucy mechara nweta ozi ọma: ọnweghị mkpụrụ ndụ kansa. ""Echela na ọ gaghị eme gị"" Lucy ka na -anara ọgwụgwọ homonụ ma na -arụkọ ọrụ na CoppaFeel ime ka ọtụtụ mmadụ mara na ọrịa ara nwekwara ike imetụta ụmụ agbọghọ. ""Echela na ọ gaghị eme gị. Ọ naghị eme gị enweghị nchekwube, ọ na -eme ka ị mụrụ anya karịa,"" Lucy kwuru. Lucy na-atụkwa anya ime ka ụmụnwaanyị ndị ọzọ nọ n'ọchịchị ojii ghọta mkpa ọ dị inyocha onwe ha nke ara. O kwuru na a ka nwere ọtụtụ ihe na -esiri ndị mmadụ ike ịkọ gbasara ọrịa ara, yabụ na ndị mmadụ achọghị ikwu maka ya. Mana o kwuru na ọ dị mkpa ikwu gbasara ọrịa kansa. Lucy kwuru na ihe ndị na -akwalite ọrịa kansa anaghị ahụkarị ụmụ nwanyị ojii, na ha anaghị achọ ikwu maka ọrịa kansa. Lucy kwuru, ""Ọ dị m ka ọ gaghị eme anyị."" ""Abụ m ihe akaebe dị ndụ"" Fran, afọ 24, echeghị na ọ ga -enweta ọrịa ara ure dị ka nwata, ruo mgbe ọ hụrụ ntụpọ n'obi ya. Na mbido, dọkịta ahụ etinyeghị uche na ya wee sị na ọ bụ naanị akpụ ""homonụ"". Ọ bụ ka ọnwa iri na asatọ gachara ka o nwere mgbaàmà ndị ọzọ wee laghachi ịhụ dọkịta ọzọ. N'ihi na ezipụla ya n'ụlọ, Fran achọghị ịlafu oge dị oke ọnụ na NHS (National Health Care System). Agbanyeghị, ka emechara ọtụtụ nyocha na nyocha ultrasound, a chọpụtara na Fran nwere ọrịa kansa ara 4, yana etuto ụbụrụ. Dọkịta gwara ya na ọ ka nwere afọ 2 ka ọ gaa. ""Adị m naanị afọ 25. Abụ m onye na -enye mgbatị ahụ. Ọ bụ mgbe m nwere ahụike kachasị mma."" Fran kwuru, ""Abụ m ihe akaebe na -egosi na ọ nwere ike ime onye ọ bụla na ndị ọgbọ ọ bụla."" Mgbe Fran gacharala '' ọtụtụ ọgwụgwọ kemoterapi '', ọrịa kansa ahụ nọ ugbu a n'ọnọdụ mgbaghara. Ọ kọọrọ akụkọ ya na ntanetị wee gwa ndị mmadụ na ụmụ agbọghọ na -enwetakwa ọrịa ara ure. Ọ sịrị, ""Ekesara m ọrịa m n'ihu ọha na social media wee dekọọ ihe niile m nwetara."" Fran kwuru na ọ na -adị ka ndị mmadụ na -egosi ọrịa ara ure dịka nsogbu ndị okenye nwanyị na -ezute. ""Tupu afọ a, echere m na ekwesịghị m ichegbu onwe m maka ọrịa kansa ruo mgbe m mere agadi.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-58821240 +business Recession: Gịnị ka ọ pụtara? "Naịjirịa abanyela ọtanisi ọzọ dịka ụlọrụ National Bureau of Statistics (NBS) si kwupụta ụnyahụ bụ Novemba 21,2020. Nke a ga-eme ugboro abụọ Naịjirịa na-abanye ọtanisi dịka onyeisiala Buhari chịrịla ruo afọ ise. Ọtanisi mbụ okpuruọchịchị ya ugbua mere n'afọ 2016. Ndalata Akụ maọbụ ""Recession"" n'okwu bekee bụ ihe ọtụtụ mba achọghị iji ntị ha nụ na ọ na-eme na mba ha. N'oge coronavirus a, ụfọdụ mba ndị gunyere Jamanị, Fransị na Italị abanyela ya bụ oge ndalata akụ. Ụfọdụ ndị ọkammụta n'ihe gbasara akụnụba obodo kwuburu na n'oge na adịghi anya na Naijirịa nwere ịke ịdabanye na ndalata akụ. Oge ndalata akụ na-abụkarị oge ihe isi ike nye mmadụ niile. Dịka ị nwere ike ibido ị nụ akụkọ maka ndalata akụ a maọbụ ""Recession"" n'ihe mgbasa ozi dị iche iche, ka anyi kọwara gị ihe bụ ndalata akụ a. Iji nweta elele dị n'akụkọ a, BBCIgbo kpọrọ ndị ọnụ na-erute n'okwu maka ihe gbasara akụnụba obodo bụ Anthony Agbo na Okechukwu Okere. Mazị Anthony Agbo kọwara Ndalata Akụ dịka oge akụnụba mba na-agbada agbada. E ji ya atule etu achụmta ego si a ga na mba. Mazị Okechukwu Okere kọwara na ọ na-abụ ọnwa atọ gara n'usoro ka a na-atule ma ụba mba ọbanyela ndalata akụ. Ọnwa ndị a na-abụkarị ọnwa Machị, Jun,Sepụtemba na Dịsemba. Ọ bụrụ na achụmta ego na ụba obodo na-agbada site na ọnwa atọ banye ọnwa atọ ndị a, ị mara na mba ahụ abanyela ndalata akụ. Ụfọdụ ihe na egosipụta Ndalata Akụ bụ : Ihe ndị a gafee ọnwa atọ na-esọ ibe ya n'azụ nke bekee kpọrọ 'quaterly' ị mara na mba ahụ abanyela ọnọdụ ndalata akụ. Agbo kwuru na n'uche nke ya, na Naijirịa abanyela oge ndalata akụ dịka ihe niile na-egosi na mba abanyela ọnọdụ a na-egosi. N'aka nke ọzọ ka Okere na-akọwa na ọ bụ mgbe Naijirịa nọrọ ọnọdụ a n'ime ọnwa isii ka e nere ike ị sị na ọbanyela ndalata akụ. Kama Okere kwuru na n'ụche obi ya na Naijirịa nwere ike ịdanye na ndalata akụ n'ihi na ego mmanụ agbidi agbdaala na mba ụwa maka ọrịa coronavirus. O kwuru sị "" Etu gọọmentị si enyere akụnụba mba aka bụ iru ihe dị cihe cihe dịka ụzọ na ihe ndị ọzọ nke na-eme ka ego bata n'aka ndị mmadụ mana ọ bụrụ na ha ereteghị ego site na mmanụ agbidi, ọ ga-esi ike ike nke a"". Kedụ etu mmadụ ga-esi kwado maka ya. Agbọ kọwara na ụfọdụ ihe mmadụ ga-eme iji gbanahụ ịda ụbịam oge ndalata akụ gụnyere Okere kwuru na ị sị ndị mmadụ jichie ego ha ga-eme ka ndalata akụ dakwasị Naijirịa kama ọ kwuru dịka Agbo si kwuo ka mmadụ niile wetulata aka n'ego ha na-emefu. Okere kọwara na gọọmentị kwesiri ibido ugbua tinye aka ịkwalite akụkụ akụnụba Naijirịa ndị ọzọ n'ihi na mmanụagbidi enwereike ọgaghị azọ anyị. Ọ mara atụ sị "" gọọmentị mepee njem na imepụta ọkụ Latrịk ka ndị ụlọọrụ nọrọ onwe banye na ya ga-eme ka ụlọọrụ ndị a nye ndị mmadụ ọrụ ma mee ka akụnụba Naijirịa gbalite"". Okere kwukwara na gọọmentị nwere ike ibite ego iji nyere ụlọọrụ dị iche iche aka iji kwalite akụnụba Naijirịa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52708243 +politics World War 3: Lee ihe ndị kpalitere agha Mbaụwa mbụ na nke abụọ Ogbugbu mba Amerịka gburu onyeisi agha mba Iran bụ Qasem Soleimani na mba Iraq akpaliteela egwu ma ọ ga ebute agha Mbaụwa nke atọ. Ọtụtụ ndị mmadụ nọ na soshal midia n'arụ aka na ọ bụ ụdị ekweghị ekwe ụfọdụ mere mmiri jị banye opi ụgbọgụrụ nke butere agha abụọ ahụ. Lee ụfọdụ ihe ndị mere n'agha abụọ ahụ: Agha Mbauwa Mbụ (1914-19) Ndị lụrụ ya: Agha mbaụwa Mbụ bidoro n'etiti mba Briten na mba Jamini n'abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1914. Mba Briten,Fransi na Russia kwụkọtara luso Jamani na Austria-Hungary na ndị na-akwado ha. Ihe butere okwu: Ọ bụ ịzọ onye ga-ewere obere mba ndị ọzọ bụ ihe butere ụka. Oge ahụ ndị mba nwere agba dịka Briten,Russia na Jamini na-azọkọsị obodo ha ga-eweghara ọchịchị ha(colonies). Jamani na Austria-Hungary weghara mba Bosnia na Morocco nke were mba Briten Iwe ha were si na Jamini ji anya ike achụ ya bụ ihe. Agha Mbauwa Abụọ (1939-1945) Ndị lụrụ ya: Na mbụ naanị Briten na Fraansi bụ ndị nọ n'ọgụ ahụ Hitler kotere. Mana mba Amerịka sonyere n'agha ahụ oge mba Japan wakporo Pearl Harbour. Ogbunigwe Amerịka tụrụ na Hiroshima n'abali isii nke ọnwa Aụgụst afọ 1945 mere ka Japan chilie aka dịka onye e meriri emerị. O bụ n'agha ahụ ka Hitler gbalịrị ikpochapụ ndị Juu niile. Ihe butere okwu: Agha Mbaụwa nke Abụọ dara dịka Adolf Hitler wakporo mba Poland n'abalị mbụ afọ 1939. Mba Briten chere ha aka mgba ka abali abụọ gachara n'abalị nke atọ nke Ọnwa Septemba. Agha Mbaụwa Mbụ na Nke Abụọ kpara mkpa mkpa dịka o butere agụụ,mbibi akụnaụba ma takwaa isi ọtụtụ mmadụ. Nke mere mba lụrụ ya jiri nwee nkweọkrịta na ha agaghị alụkwa agha ọzọ. N'agbanyeghị na a lụghị agha abụọ ndị a n'ala Afrịka mana ndị mba ofesi ndị nwere ọchịchị n'ala dị n'Afrịka dịka Naijiria dọrọ ụmụ afọ Afrịka gaa lụọ ya bụ ọgụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50985233 +health Covid-19 n'otu nkeji: Anyanwụ, ekpomọkụ anaghị agwọ coronavirus Akụkọ na-efegharị na oke ekpomọkụ nwere ike igbu nje coronavirus dị mmadụ n'ahụ. Mana onweghi otu mkpụrụ eziokwu dị na nke a. Ihe nkiri a kọwara ya nke ọma. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chukwunaeme Obiejesi https://www.bbc.com/igbo/afirika-52158519 +health "Coronavirus Response: ""Ihe mere coronavirus ejighị kpa ike n' Afrika ka mba ofesi "" - Esther Osemwegie" Ọrịa coronaviru ataala isi ọtụtụ ndị dọkịnta, ndị nọọsụ na ndịọrụ ahụike ndị ọzọ. Mana akụkọ a ga-adị ka aja mbele ma ọ bụrụ na i jibeghi anya gị hụ onye o metụrụ. Esther Osemwegie, onye na-arụ ọrụ dịka nọọsụ n'obodo oyibo kọro, BBC Igbo ihe o jirila anya ya hụ. O kwuru na ịgwọ ndị coronavirus dị ka onye agha nọ n'ọgbọ ọgụm o nwere ike ịnwụ n'oge ọbụla. Ihe niile a ọ gabigara mere o ji dee akwụkwọ nke o kwuru na ọ chọrọ iji kụzie ọtụtụ ihe ma dọkwaa ndị mmadụ aka na ntị. Ndị mere akụkọ a Uche Akolisa https://www.bbc.com/igbo/afirika-55455496 +politics Shehu Shagari: Buhari agaala mgbaru na Sokoto Akụkọ dị mkpa: Mgbaru Shagari Onyeisiala Muhammadu Buhari agaala mgbaru n'ezinaụlọ onye chịburu Naịjirịa bụ Shehu Shagari, na Sokoto. Cheta na e liri ya ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa a, n'usoro ndị alakụba. Ọzọ, Gọọmentị Anambara gwara BBC na ha amalitela usoro ịhọpụta 'nke bụ nke' n'ime ihe ruru ozu iri ise gbara ọkụ n'otu ụlọozu dị n'Enugwu Ukwu. Gụọ ya n'uju ebe a: 'Ozu gbara ọkụ ruru 50' - Kọmishọna ahụike Anambara N'ofesi, Kamal Hossain bụ onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-azọso onyeisiala Mba Bangladesh bụ Sheikh Hasina oche ya na ntuliaka ha na-eme na mba ha, akatọọla ntuliaka ahụ ma kwuo sị ka e megharịa ya. N'agbanyeghị na ọ dị ka Hasina na-emeri site na vootu ole a gụkọrọla, akụkọ na-ekwu na aka enwe dị n'ofe, ebe ọgụ dapụtara na ntuliaka ataala isi ihe ruru mmadụ iri na asaa. N'egwuregwu, Otu ọkpụ goolu Ngolo Kante nyerela Chelsea, mere ka ha merie Crystal Palace, ma mee ka ha were pọịntị ise na-aga Arsenal na Premier League. Ebe Man City gbarala isi onwe ha site n'iji ọkpụ goolu atọ merie Southampton na be ha. Ndị Igbo kwesịrịịchị n'afọ 2023 - Obasanjo Onye bụbụ onyeisiala Naịjirịa akpọrọ Olusegun Obasanjo arịọla ụmụ Naịjirịa ka ha nye ndị Igbo ohere ịchi Naịjirịa. O kwuru nke a mgbe ọ gara njem nleta n'Ukpor dị n'Anambara steeti. O gwakwara ndị Igbo ha kpachara anya ha maka nkwa APC na-ekwe ha maka inweta oche onyeisiala na n'afọ 2023 makana ọ bụ ihe efu i were okwu ndị otu pati ahụ wee mere ihe. Lee ihe ndị mmadụ sara ya na Twitter‏ @lanrehussain kwuru ka Obasanjo chere ka emecha ntuliaka 2019 tupu okwuwe maka ntuliaka nke 2023. @justopomulero na-ajụ maọbụ Atiku ka a ga-atụkwasị obi inye ndị Igbo ọchịchị n'afọ 2023. Mana ‏@AbdulRa60024938 etu o si nye onye Igbo ọchịchị n'afọ 2007. N'akụkọ ọzọ, Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ka ọkọlọtọ Naịjirịa yọdatatụ na ebe niile ehibere ụlọọrụ ndị agha Naịjirịa iji wee kwanyere Shehu Shagara onye bụbụ onyeisiala Naịjirịa, nwụrụlanụ ugwu ikpeazụ. Eliri Shagari onye nwụrụ ụbọchị Disemba iri abụọ na asatọ n'Abuja na be ya n'ụbọchị Disemba iri abụọ na itoolu. N'ofesi Ebidola itu vootu na mba DR Congo kamgbe adọtịchara ntuliaka ruo afọ abụọ. Ihe ruru mmadụ nde iri anọ ruru itu vootu na mba ahụ ebe onyeisiala bụ Joseph Kabila nọ n'oche ọchịchị kamgbe afọ 2001 kwetere iritu. Mana nkwado ya bụ ntuliaka nwere ọtụtụ nwakpo na nsogbu makana achọrọ ịnapụ mmadụ ruru otu nde na ọma ikike ịtụ vootu. N'Egwuregwu, Kamgbe Liverpool merichara Arsenal n'asọmpị Premier League ha gbara n'ụbọchi Disemba iri abụọ na itoolu, ndị mmadụ kpụ ọgbabọọlụ Pierre -Emerick Aubameyang n'ọnụ. Ụfọdụ kwuru na etu o si gbaa boolu edoghị ụwa anya dịka onye ama na-akpa ike n'egwuregwu bọọlụ. Ha kwukwara na ohere ịsa goolu o mefuru karịrị akarị. Nkeji Ututu Ihe nkiri taa https://www.bbc.com/igbo/afirika-46714375 +health Ihe i kwesiri ịma tupu i yiwe 'waist trainers' "Nke na-ewuru ụmụnwaanyị kamgbe ụwa bụ inwe ahụ dịka ịkọ mmanya nke a kpọrọ 'hours glass' na Bekee. Ya bụ afọ tara ata, ara buru ebu na ukwu dọnyere adọnye kpọmkwem. I nwee nke a, ị mara na i chizugo, bụrụzie olu gbajie ihe ọbụla nwere olu. Ụdị ahụ a abụghị taa ka ọ malitere iwuru ụmụnwaanyị, mana ụzọ e si aga Ọnịcha dịghịghịkwanụ nso cha cha. Ngala ụmụnwaanyị na-akarị akarị ma ha nwee ụdịrị ahụ mere ọtụtụ ji eforo ntutu taa ime ihe ọbụla ọ ga-eri iji nweta ahụ iko mmanya. Mana ya bụ okwu inwetakwanụ afọ tara ata abụghị ugbo a na-aga ma e bughi mmiri maka na ụdị ahụ ndị Afịrịka nwere na-echere ha aka dị egwu, ọ na-arịa ahụ nke ukwuu ọkachasị maọbụrụ na nwaanyị amụọla nwa. Nke a kpatara ha jiri malite iṅomi ihe ụmụnwaanyị ndị ọcha na-eme na ihe ha na-eyi iji nweta afọ tara ata nke a kpọrọ ""Corsets"" na Bekee. Ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị a ma ama dịka Beyonce, Kim Kardashian na-eyikwa ya ma na-egosi ya na soshal midia. Ya mere ọtụtụ ụmụnwaanyị ji na-eyikwa ya bụ ihe nakwa nke a na-akpọ ""Waist Trainers"" bụ nke ị ga-eyi ma ị na-emegharị ahụ iji hazie afọ gị mee ka ọ baa n'ime. Mana ajụjụ dị mkpa ịjụ bụ, ọ bụ naanị inweta afọ tara ata, kedụkwanụ maka ahụike nwaanyị na-eyi ihe ndị a? O nwere ihe ọ na-eme n'ahụ ya ka ọ dị mma iyiri na-aga? BBC Igbo buru ajụjụ ndị a bugara Dọkịnta na-ahụ maka ahụike ahụ ụmụnwaanyị bụ Chidiebele Ojukwu. Ọ gwara BBC Igbo na e nwere ọtụtụ ihe ndị na-eso iyi ya bụ ihe nke na-emegide ahụ nwaanyị n'ụzọ dị icheiche mana ụmụnwaanyị amaghị. Ihe ise iyi 'corset' na 'waist trainer' na-eme n'ahụ nwaanyị. 1. Ọ na-afịkọ ihe dị n'ime ahụ nwaanyị dịka eriri afọ Dịka dọkinta Ojukwu siri kwuo, etu ""Corset"" ebuba afọ mmadụ ime bụ na ọ na-afịkọ akwara afọ mmadụ ma jide ihe ndị dị n'ime afọ dịka eriri afọ na ihe ndị ọzọ kekọsịa ma bụgharịa ya ebe ha kwesiri idị. Ya bụ o si ebe eriri afọ kwesiri ịdi, bụgharịa ya maka na ohere adịghịzi ịnabata ebe ọ ga-anọ. Nke a nwereike ibute nsogbu dị icheiche so egwerighi nri nke ọma n'afọ mmadụ ga-ebute nsogbu afọ dị icheiche. 2. O nwereike imetụta akụkụ ahụ dị n'ukwu nwaanyị nke a kpọrọ 'pelvic organ' na Bekee. Ụfọdụ akụkụ ahụ ndị a bụ akpa nwa, akpa mamịrị na ndị ọzọ. Oge nwaanyị yiri 'Corset', ọ ga-agbalite ndagide dị n'ime afọ ya nke ga na-ebudata akụkụ ahụ ndị ahụ dị ya n'ukwu n'ala nwereike ibute ihe a kpọrọ 'hermarhroids' na 'prolapse' na Bekee bụ ebe akpanwa si n'ikpu nwaanyị na-adapụta. 3. O nwereike ibute maamịrị ịdapụ nwaanyị n'ike. Nwaanyị ji kọsetị ekechi afọ ya oge ọbụla na adagide akwara ndị dị n'ukwu ya ma n'afọ ya dịka Dọkịnta Ojukwu siri kwuo nke bụ na akwara ndị ahụ agaghị esizi ike nke ọma bụ na ọ chị a ọchị, maamịrị adapụta maọbụ na ọ gaghị akpadoli ahụ ma o jide ya. 4. Ọ na-eme ka afọ yọọ ayọ. Akwara ndị dị n'afọ na-esi ike n'onwe ma na-adọtị na-adọbakwa n'akwa ya na-eye aka ikwagide azụ mmadụ na etu mmadụ si kwụrụ. Mana oge nwaanyị jiri kọsetị kedo afọ ya, kama afọ ya ịrụ ọrụ ahụ, kọsetị ahụ ga na-arụ ya nke ga-eme na afọ ya ga-anọzi nkịtị, oge ọ kwụsịrị iyi ya, afọ ya aƴọ ayọ maọbụ ọ malite inwe azụ mgbu. N'okwu Dọkịnta Ojukwu: ""Ụfọdụ ụmụnwaanyị bụ ha yipu 'waist trainer' ha si hee!, afọ m atagọkwa mana afọ gị atago, gịnị ga-emezi ihe ndị nọ gị n'ime afọ? Nwaanyị mụrụ yichaa kọsetị, ọ dị ime ọzọ, afọ ya ga-emepekwa karịa maka na afọ ya esighi ike ịrụ ọrụ imechi ya, kama ọ bụ kọsetị rụrụ ọrụ ahụ."" 5.Ọ na-enye nsogbu n'iku ime: N'okwu Dkt. Ojukwu; ""Onye yi kọsetị anaghị ekuta ume nke ọma"". Oge mmadụ na-eku ume, akwara ndị nọ n'afọ kwesiri ijiri aka ya na-adọtị na-adọbakwa, i kuo ume, afọ gị ebuo ibu nweeike nabata ikuku, i kupu ume, ọ taa, kupu ajọ ikuku. Mana i yiri kọsetị, afọ gị agaghị agbasa nke ọma ga-eme na ọ gaghị anabata ikuku nke ọma ma kupukwa ajọ ikuku nọ gị n'afọ makana kọsetị jikwara ya. Nke a nwereike ibute ọtụtụ nsogbu n'ime ahụ mmadụ. Dọkịnta Ojukwu kwuru: ""I lechaa ụdị ihe a anya, kedụ ka ị ga-esi gwa mmadụ ya yiri 'Waist trainer"" na-emegharị ahụ bụ mgbe o kwesiri ikumi ume ekumi maka ahụ ọ na-emegharị?"" O kwuru na oge mmadụ na anaghị eute ume nke ọma, ime ahụ ya agaghị enwetacha ezigbo ikuku. 6. Ọ bụrụ na akwara afọ gị ayọ ayọ ọ ga-emetụta akwara ukwu gị nke ga-emetụta etu i si enwe aramara. Akwara ndị a dị n'ukwu nwaanyị bụ ihe gbara ikpu ya gburugburu na-eme na ọ bụrụ na o siri ike, ọ ga-ejikwa onwe ya nke ọma mana onye na-eyi kọsetị akwara ukwu ya yọrọ ayọ, ọ ga-eme ka akwara ikpu ya yọọkwa ayọ bụ na ikpu ya ga na-aga siriri werere. Ọ gaghị ejikwata amụ nke ���ma, dịka Dkt Ojukwu siri kwuo. Ọ bụrụ na ikpu nwaanyị dịka ọmị, obi agaghị adị ma ya ma nwoke ya mma cha cha maka na aramara ha agaghị adị ụtọ etu o kwesiri. Akwara nke a na-enyekwa aka ka nwaanyị nwee nke a kpọrọ 'orgasm' maka na ọ bụ ya ga na-akwakọ ọnụ ma nwaanyị nwee 'orgasm'. Dkt Ojukwu kwuru na nwaanyị nwereike iyi kọsetị n'ime akwa ya iji nye ya ụdị ahụ ahụ ọ chọrọ mana ọ gaghị eyi ya ogologo oge maka na nsogbu so ya n'ọdịnaihu karịri akarị. Ọ bụrụkwa na i nwere nsogbu dịka ejikwaghị maamịrị, i kwesighi iyi ya cha cha dịka Dkt Ojukwu siri kwuo. Onye na-emegharị ahụ ekwesighikwa iyi ya cha cha, jiri aka gị rụọ ọrụ n'akwara afọ gị ka ọ gbasie ike, jikwa gị nke ọma. Nwaanyị mụrụ nwa o kwesiri iyi ya? Dọkịnta Ojukwu kwuru na nwaanyị mụrụ nwa ekwesighi iyi ya maka na ọ bụghị naanị maka ibuba afọ, o kwesikwara ile anya maka ahụike ya. Nwaanyị mụrụ nwa, afọ ya adọsala adọsa maka afọ ime. Akwara ukwu ya ma akpa nwa ya gbaturu agbatu maka nwa nọbu ya n'afọ, i werekwa kọsetị kechie ya ghara ikwe ka ọ gbadachaa, ọ ga-eme na akpanwa ya nwereike ọ gaghị alaghachị azụ ebe o kwesiri, ọ ga na-ehikwa maamịrị na ahụ, o nwekwara ike inwe ""prolapse"". O kwuru na kọsetị ndị a na-arụ bụ akwara dị mmadụ n'ime afọ a kpọrọ 'Transverse Abdominus muscle' bụ ihe a na-amụta eṅomi. Maka na akwara ahụ, si n'azụ mmadụ jịkọọ afọ gị gaa n'ihu. Dkt Ojukwu kwuru na akwara ahụ ka nwaanyị ọbụla kwesiri ime ka o sie ike site na ime ụfọdụ mmegharị ahụ dị icheiche ga-enweta ya ka o wee jikọta ya ahụ mana kọsetị ga-eme ka ọ yọọ ayọ. Nwaanyị mụrụ nwa nwere ụfọdụ mmegharị ahụ o kwesịrị ime maka afọ ya kpọmkwem iji mechie oghere dị ya n'afọ nke afọ ime butere tupu o nweeike imebe ụdị ndị ọzọ. Otu onye na-achọghị ka a kpọpụta aha ya BBC Igbo gwara okwu kwuru na ya nwere ọtụtụ nsogbu n'afọ ya maka na ya na-eyi kọsetị. O kwuru na ya rie nri, afọ ya anaghị ezu ike, ọsịsọ ga na-asọ ya, eriri afọ ya ga na-atụgharị ya. Oge ya gara ụlọọgwụ, dọkịnta agwa ya kwụsị iyi ya, oge ya kwụsịrị ya ka ya malitere inweta onwe ya, nke ahụ mere ya anaghị eyizi ya. Onye ọzọ bụ Gloria Orji-Emodi kwuru na ọ bụ etu ka onye mma ka ọ ga-eme. O kwuru na kọsetị nyere ya aka oge ya mụchara nwa iji weghachite afọ ya. O kwukwara na ọ bụ dọkịnta ya gwara ya ka ọ na-eyi ya ma o nwebeghi ihe ọbụla mere ya site na ya. Onye ọzọ bụ onye na-emgharị ahụ nke ọma bụ Nneoma Ihenacho kwuru na kọsetị anaghị ata abụba afọ cha cha, kama ọ ga-eme akwara afọ ayọọ ayọ maka na oge ị na-emegharị ahụ, kama ime ka akwara ndị ahụ gbasie ike, kọseti ejide ha, ihe ị na-eme agaghị eru ha. Mana n'ihe niile a, dkt Ojukwu kwuru na ihe ndị so ya ka uru ọ na-enye ma dọọ aka na ntị ka nwaanyị jisie ike jiri imegharị ahụ hazie akwara afọ karịa iyi kọsetị. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/53501821 +health Mental Health Awareness Week: Psychosis, Bipolar disorder na ọrịa isi ndị ọzọ ị kwesịrị ịma maka ya "Ọtụtụ oge ka ndị ọ na-edoghi anya na akpọ ndị nwere ọrịa isi ""ndị isi mgbaka"". Mana ọ bụ ọrịa isi niile bụ 'isi mgbaka'? Akụkọ a na-akọwa etu ọrịa isi dị iche iche na-esi emetụta ndị mmadụ na etu o si dị iche n'isi mgbaka. Site n'ụbọchị itoolu ruo 15 nke nke ọnwa Mee afọ 2022, bụ oge a họpụtara maka nkọwa na mgbasaozi maka ahụike nke a kpọrọ 'Mental Health Awareness Week' na Bekee. A wepụtara ụbọchị a iji gbaa tọọchị n'ihe gbasara ọrịa ndị na-emetụta isi, nke gụnyere ọrịa ụbụrụ, ọrịa uche wdgz. Psychosis: Nnyocha ngalaba ahụike mba UK a kpọrọ 'National Health Scheme' (NHS) kọwara ọrịa a kpọrọ 'psychosis' dịka mgbe mmadụ na-ahụ ihe na-eme n'ụwa a dịka ọ na-eme n'ụwa ọzọ. Nke a gụnyere ịhụ ihe ndị ọzọ nọ gị nso anaghị ahụ nakwa ịnụ ihe ndị ọzọ anaghị anụ (Bekee kpọrọ hallucinations), nakwa ikwenye n'ihe ndị emeghi n'eziokwu, ọkachasị na mmadụ bu n'obi imerụ ha ahụ (Bekee kpọrọ ya delusions). Ụfọdụ oge onye na-arịa psychosis anaghị ama na ọ bụ naanị ya ka ihe na-eme na-eme; ụfọdụ ndị nọ ha nso na-eche na isi agbakaala ha. Ihe na-ebute psychosis gụnyere: Ọgwụgwọ psychosis: Psychosis na-abịa abịa na-ala ala dịka onye ọbịa, mana ọ naghị alakarị kpamkpam. Nlekọta onye na-arịa psychosis gụnyere ịṅụ ọgwụ nke ụlọọgwụ na-enye. Ọrịa 'Bipolar Disorder' NHS kọwara 'Bipolar disorder' dịka ọrịa na-emetụta ụbụrụ nke nwereike ịgbanwe ọnọdụ mmadụ n'otu ntabi anya. Onye na-arịa ọrịa ụbụrụ a nwereike inwe nnukwu obi aṅụrị n'otu mgbe nke nwereike igbanwe ma bụrụ ọnọdụ mwute ozugbo. Ndị na-arịa ọrịa ụbụrụ a na-ahụta ihe ndị dị etu a: O nweghi onye ma kpọmkwem ihe na-ebute ọrịa Bipolar, mana ọtụtụ ihe gụnyere oke nchekasị, oke ndọga, oke nsogbu ụwa nakwa ihe ndị na-agbanwe ndụ (dịka ihe mberede a kpọrọ trauma), nwereike ịkpali ya. N'afọ 2021 ka otu onye ejije a ma ama bụ Cha Cha Eke kwuputere na ọ na-arịa ọrịa Bipolar , nke mere ka o wusaa ebe niile. Ọrịa Dementia Ọrịa Dementia bụ ọrịa uche na-emetụta akụkụ ụbụrụ a kpọrọ 'Hippocampus' nke bụ ụzọ e si abanye ihe jikọrọ echiche. Ọrịa a na-emetụta ndị mmadụ dịka ndị na-arịa ya na-echefukarị ihe. Ọ na-emekarị ndị merela okenye maka na ọ bụ ọrịa na-abịa n'agadị. Ọrịa isi ndị ọzọ gụnyere: Obsessive Compulsive Disorder (OCD) Ọnọdụ a na-eme ka mmadụ nwee echiche ime ihe na anaghị ekwe apụ n'uche onye ahụ. Ọnọdụ ahụike a nwereike ịkpalite mgbakasị ahụ dịka onye ga-achọrịrị ime ihe ọbụla gbatara ya n'uche. Ọnọdụ a nwereike imetụta ụmụnwoke, ụmụnwaanyị nakwa ụmụaka. Ndị bu ọnọdụ a nwereike ịnata ọgwụgwọ sịte n'ịṅụ ọgwụ nakwa usoro enyemaka ndị ọrụ ahụike ụbụrụisi nke Bekee na-akpọ ""psychological therapy"". Autism Autism bụ otu ọrịa na-emetụta mkparịtaụka nakwa akparamagwa . Ọtụtụ oge ndị mmadụ na-aghọtaghie ya dịka ara. 'Autism na-emetụta ụbụrụ isi ndị mmadụ ọkachasị mgbe mmadụ ka na-eto eto. O dochabeghi ndi ọkacha mara anya ihe na-akpata ya bụ ọrịa, mana nnyocha egosila na ụbụrụ ndị nwere 'autism' na nke ndị ọzọ anaghị abụcha otu ihe. Mana ọ dị mwute na ọtụtụ na-akpọ ndị nwere ọria a 'imbecile' ma were ha na-eme ihe ọchị. Nke a jọgburu onwe ya. Ndi nwere 'autism' bụ mmadu zuru oke ma nwee uche zuru oke. Post-Traumatic Stress Disorder Nke a bụ ụdị ọnọdụ obi mmapụ na ụjọ nke Bekee na-akpọ ""anxiety"". Ndị mmadụ na-adaba n'ọnọdụ a site n'ihe dị oke egwu maọbụ ihe mkpagbu na obi mmapụ mere mmadụ n'oge gara aga. Ọnọdụ a nwereike ime ka mmadụ ghara ịrahụ ụra. Ụdịrị ihe ndị mere mmadụ nwereike ịkpalịte ọnọdụ a bụ: Ihe mberede, mwakpo n'aka ndị ọjọọ, mwakpo maọbụ ndịna n'ike, ọnọdụ dị egwu n'ịmụ nwa wdgz. Ndị bu ọnọdụ a nwereike ịnata ọgwụgwọ sịte n'ịṅụ ọgwụ nakwa usoro enyemaka ndị ọrụ ahụike ụbụrụisi nke Bekee na-akpọ ""psychological therapy""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61407212 +health World Mental Health Day: 'Obi ịdamba mere ka m chere na igbu onwe m kara m mma' Nwaada rịaburu ọrịa obi ịdamba kọwara ihe butere ọrịa a nakwa ihe ndị ọ hụrụ n'ime ọnọdụ a obi ịdamba. O kwuru na ọ nweghi ike ịkọwa ihe kpatara obi ji na-ada ya mba ma ọ bụrụ na a jụọ ya. Nwaada gara n'ihu kwuo na nke a mere o ji chee na igbu onwe ya kaara ya mma. Ọ dọkwara ndị mmadụ nwere obi ịdamba aka na ntị ka ha gaa n'ụlọọgwụ iji nyere onwe ha aka. Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50002728 +health Covid-19 n'otu nkeji: Chloroquine ọ na-agwọ ọrịa Coronavirus? Dịka akụkọ na-ewu na Chloroquine bụ ọgwụ dị ire maka ọgwụgwọ ọrịa Coronavirus. Mana n'aka nke ọzọ, enwebeghị ngalaba ọnụ na-eru n'okwu pụtara kwuo na ya bụ ọgwụ Chloroquine ga-agwọnwụ ọrịa Coronavirus. Ihe onyonyo a ga-agwa gị nke bụ eziokwu. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Chukwunaeme Obiejesi, Jessica Nwankwo na Chimezie Ucheagbo https://www.bbc.com/igbo/afirika-52040820 +sports Juventus na Lyon: Urata ekwoola n'isi Christiano Ronaldo na ndị Juventus Christiano Ronaldo na ndị otu ya bụ Juventus aghọọla Erọn gbara aka laa n'asọmpi UEFA champions league nke afọ 2020. Olympique Lyon nke mba Fransi dulara ha mmụọ n'abalị Fraide. Juventus ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie Lyon, mana o zughi iji bufee ha n'agba nke ọzọ. Cheta na Lyon jibu otu ọkpụ goolu asataghi asata merie Juve oge ha abụọ zutere na Fransi. Nke a pụtara na Lyon lafeere site na nke Bekee kpọrọ 'away goal rule'. Ihe kpatara nke a bu na ha nyetere otu goolu na be Juve, mana Juve enyeteghi goolu ọbụla na be ha. Ọ bu Ronaldo nyeteere Juve goolu abụọ n'abalị Fraide, ebe Memphis Depay nyere otu goolu nke ndị Lyon. Manchester City gbara Real Madrid ụgbọ nwa mkpi sị ha kwakọrọ pụọ n'asọmpi Uefa Champions League. Ha mere nke a site n'iji goolu abụọ asatara merie n'ụkwụ nke mbụ ma were goolu anọ asatara abụọ na ngụkọ sị sie Madrid ka ọ dị. Ha malitere ibu nye madrid akpa njem ụla na nkeji 9' mgbe Raheem Sterling nyere goolu. Mana Real Madrid jụrụ ịmaburu akpa a mgbe Kareem Benzima sara goolu ahụ na nkeji 28'. Mgbe ha batara n'ọkara abụọ n'asọmpi a ka Gabriel Jesus siri ọnwụ nye Real Madrid goolu ọzọ na nkeji 68' nke mere ka olileanya ha agwụ. Madrid siri ọnwụ ka dimkpa ha bụ mana Man. City fooro ntụtụ taa sị na Madrid ga-abarịrị n'ụgbọ nwa mkpị a. Etu a ka ọ dị ruo mgbe ogbu pịpịrọ gbuchiri asọmpi ahụ. Mmerie Man. City mere ka ha tozuoke n'ọkara ikpeazụ asọmpi Champions League nke afọ 2019/2020 ebe Real Madrid akwakọọrọla pụọ. https://www.bbc.com/igbo/53703214 +sports Nigeria vs South Africa: Eagles arachaala Bafana ka banana Naịjirịa na Saụta Afrịka chipụrụ ya n'asọmpi nke agba nke anọ nke Afcon, ma gosi ha onye bụ eze. Goolu William Troost-Ekong gbakpuru na nkeji 89 kụrụ ntu n'elu akpati ndị Saụt Afrịka bu bịa ije a. Naịjirịa gosiri na ha abụghị mmọnwụ a na-akwa aka site n'ọkara nke mbụ mgbe Samuel Chukwueze pịakpuru goolu nke mbụ na nkeji iri abụọ na asaa. Iji gosi na ya bụ egwu abụghị egwu a chị ụtaba n'aka agba, ndị Saụt Afrịka kpakwara ike nke ha oge Bongani Zungu nyere goolu biri n'azụ Odion Ighalo wee danyere ya. A jụrụ ihe onyonyo VAR ma ọ bụ ha gaa n'ihu kpọọ ya goolu tupu a gụnye ya ka goolu. Chukwueze so na ndị a kpụ n'ọnụ maka udịrị ike ọ kpara. Ka ọ dị ugbua, Naijiria ga-ezute onye ọbụla meriri n'etiti Ivory Coast na Algeria, n'agba nke ọkara-ikpeazụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48944232 +business Real Estate Investment in South-East Nigeria: Etu ị ga-esi zụta ala n'ala Igbo ma rite uru N'izuụka ole na ole gara aga ka NwadaIgbo Uche Jumbo kwuru okwu sị na itinye ego n'azụmaahịa ala (Real Estate Investment) na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa (in South-East Nigeria) na-aghọ ahịa. Ọ sị na oke ala atọ ọ zụrụ n'Aba afọ asatọ gara aga, na o ji ego dị nde naịra atọ (N3.8m) na ụme ree ya ugbua mana nke ọ zụrụ na Legọs n'otu oge ahụ na o rere ya nde naịra iri anọ na ise (N45m). Nke a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ ji na-akatọ ya ebe ndị ọzọ sị na ọ bụ eziokwu ka o kwuru. Mana BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị na-ere ala nakwa ụlọ na mpaghara Ọwụwanya Anyanwụ ka tinye ọnụ n'okwu a. Kedụ ihe ndị na-ere ala n'Ọwụwa Anyanwụ kwuru? Awka Ọzọ Okwudiri Nwude bụ onye na-ahụ maka ire ala nke bụ in Real Estate Investment nakwa ụlọ n'Awka dị n'Anambra Steetị sị na o nweghi ọghọm dị n'ire nakwa ịzụ ala n'Ọwụwa Anyanwụ. Ọ sị na ịzụ ala dị mma karịa itinye ego n'ụlọakụ maka na ụlọakụ agaghị enye gị ọmụrụ nwa mana ị zụọ ala taa ọ ga-amụtara gị nnukwu nwa echi ma ị chọrọ ire ya. Ọ sị na onye zụrụ ala n'ebe dịka Mgbakwu maọbụ Ebenebe dị n'Awka North n'ọnụego dịka pụkụ naịra 200, na ọ chọrọ ire ya n'afọ atọ na o nwereike ire ya puku naịra 350. Mana ọ bụrụ ebe dịka Awka South zụọla n'ọnụego puku naịra 300 na o nwereike ire ya ihe ruru otu nde (N1m) n'ime afọ abụọ. Nwude sị na ihe mere ala ji adala ọnụ bụ n'ihi mmepe ebe ala ahụ dị, na ọ bụrụ na a malite ịrụ ụlọ maọbụ ụzọ, na ala niile dị na gburugburu ebe ahụ ga-adala ọnụ. N'iji maa atụ, ọ sị na ọ zụrụ ala n'ebe 'Road Safety' dị n'Awka n'ọnụego nde naịra atọ na ụma (3.5m) n'afọ 2016 mana ugbua na ihe a na-ere ala ebe ahụ ugbua bụ nde naịra iri na abụọ (N12m). Nwude sị na etu ka ire na ịzụ ala dị na mpaghara dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ. Enugwu N'otu aka ahụ Chuma Ezealigo na-ahụ maka ịzụ nakwa ire ala n'Enugwu sị na ihe dị mkpa bụ inwete ndị maara anya ala tupu mmadụ azụọ ala. Na onye kwuru na azụmaahịa ire na ịzụ ala adịghị eme nke ọma, nwere na onye ahụ anaghị erute nso maara ihe a na-akọ. Ezealigo sị na ọnụego iji ree maọbụ ịzụ na-ada bụ site na etu mpaghara ala ahụ dị jiri mepee emepe. N'iji maa atụ, ọ sị ndị zụrụ na 'zoo estate' dị n'Enugwu n'afọ ise gara aga zụrụ ya nde naịra iri anọ (N40m) mana ihe a na-ere ya ugbua bụ otu nde narị naịra (100m) ma ọ bụrụ na ị hụ ahụ. Ọ sị na ego ole a zụrụ ala na 'golf estate' n'afọ ise gara aga bụ nde naịra atọ na ụma (N3.5m) mana ugbua ala na-adazi ihe dịka nde naịra iri atọ (N30m). Ọ sị na o nweghi onye zụrụ ala n'Enugwu ugbua na-agaghị ere ya ugboro abụọ karịai ihe ọ zụrụ ya n'afọ ise na-abịa abịa. Ezealigo dọrọ aka na ntị sị na onye chọrọ ịzụ ala ekwesighi ịzụ ala obodo nwe ma ọ bụrụ na ọ gaghị arụ ya ozugbo, na ha nwereike iresi ya onye ọzọ. Ihe mmụta Na nchịkọta, ndị ọkachamara n'ire ala abụọ a mere ka a amata na ego ole a na-ere maọbụ na-azụ ala bụ site n'ebe ala ahụ dị. Na ọ bụrụ ala dị n'ebe mepere emepe, na ọnụego ya ga-adị elu karịa nke dị n'ebe ka na-emepe emepe. Nwude sị na o nweghi iwu na-achịkwa ego ole mmadụ ga-ere ala ọ zụrụ, na ọ bụ ego ole maasịrị onye nwe ala ka ọ na-ere ya. Ihe ọzọ bụ na o nweghi ọghọm dị na mmadụ ịzụ ala maka na ala na-amụta nnukwu ego n'oge na-adịghị anya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-56034728 +business Bitcoin to dollar: Ego ole ka otu bitcoin na-ada na naịra ugbua? "Ikenna Ogbaraegbe bụ otu onye na-azụ ma na-ere ego igwe a kpọrọ bitcoin akọwaala ego ole ọ na-ada ma a tụnyere ya na naịra nakwa dọla. Nke a na-abịa dịka ụlọakụ etiti machiri ụlọakụ dị icheiche na Naijirịa itinye aka na Crypto currency n'ụzọ ọbụla Ogbaraegbe sị na ego ole bitcoin na-ada kwa ụbọchị dabere n'egole dọla na-ada kwa ụbọchị ma a tụnyere ya naịra. Ọ sị n'iji maa atụ dịka taa ụbọchị 9 Febụwarị afọ 2021, na otu bitcoin (1btn) bụ ihe dịka puku dọla iri anọ na isii ($46,720). Ebe otu dọla ($1) bụ narị naịra anọ na iri itoolu (N490), ọ bụrụ na ị gbakọọ ya ($46,720 X N490) ọ ga-apụta (N22,892,800). Nke a pụtara na otu bitcoin bụ nde iri abụọ na abụọ na ụma (1 btn = N22,892,800) dịka ọ dị n'ụbọchị 9, Febụwarị 2021. Mana Ogbaraegbe sị na ọnụego bitcoin na-agbago ma na-arịtukwa na ọ naghị anọkaarị otu ebe. Ka m si eji Cryptocurrency enweta mbadamba ego Dịka ụlọakụ etiti machiri ụlọakụ dị icheiche na Naijirịa itinye aka na Crypto currency n'ụzọ ọbụla, ụfọdụ ndị ji ya bụ Cryptocurrency akpa ego na-eti mkpụ na ya bụ mmachi bụ ezigbo ọdachi na-ebe ha nọ. Kama ụfọdụ na-asị na ọ bụ aghọtaghị mere ndị mmadụ ji atụ egwu. Ndị ntoroọbịa na Naijirịa ekwuola etu ya bụ mmachi siri metụta ha. Augustine Arachie bụ onye nkuzi na Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka Anambra steeti, ma na-azụkwa ahịa Cryptocurrency. Ọ kọwara na gọọmentị agaghị amachinwu bitcoin maọbụ cryptocurrency ndị ọzọ, kama ha emeela ka ọ siere ndị mmadụ ike iji ya azụ ahịa. Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n'ihe o kwuru : N'akwụkwọ Osita Nwanisiobi bụ ọnụ na-ekwuchitere CBN , ụlọọrụ CBN kwuru na ha machibuola ụlọakụ niile nọ Naịjirịa iji cryptocurrency kamgbe afọ 2017. CBN kpọpụtara mba dịka China, Canada, Taiwan, Indonesia, Algeria, Egypt, Morocco, Bolivia, Kyrgyzstan, Ecuador, Saudi Arabia, Jordan, Iran, Bangladesh, Nepal na Cambodia amachiela iji cryptocurrency zụọ ahịa makana e nwerike iji ya nye ndị oyi egwu ego, zụọ ego nakwa mee ihe ọjọ ndị ọzọ. Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na ebe ọ bụ na ọ bụ ndị na-enweghị ikike na-enye ya bụ'cryptocurrencies' mere ka ọ ghara ịdaba n'usoro CBN si eme ihe dịka ha depụtara na CBN act (2007) ka ngalaba na-enye ego na Naịjirịa. CBN kwuru ọ ka na-agbagoju ha anya etu ndị nwe cryptocurrency si ezo ihu nke mere ka ndị mmadụ na-aju ihe mere ha ji ezo ihu ha maọbụrụ na ha ma na iwu kwadoro ihe ha na-eme. Ha kwuru na mmachị a agaghị emebi ihe ọbụla gbasara iji ego kwụ ụgwọ na intanet maọbụ nwulite FinTech. Cryptocurrency: Mmachi cryptocurrency ga-eme ka ụbịam karịa na Naịjirịa - Atiku Osote Onyeisiala Naịjirịa n'oge gara aga bụ Abubakar Atiku etinyekwala ọnụ n'ịkatọ mmachi gọọmentị machiri cryptocurrency na Naịjirịa. Atiku kwuru nke a site n'akara Twitter ya n'ehihie Satọde. O kwuru na ugbua abụghị oge gọọmentị kwesịrị itinye atụtamụ dị otu a nke nwere ike ime ka ụbịam kawanye njọ. Atiku kwuru na ụzọ ka mma iji soo ihe gbasara 'cryptocurrency' bụ ịchọ ụzọ gọọmentị ga-esi na-ahazi ya, ọbụghị ịkwụsị ya kpamkpam. Ọ gara n'ihu kwuo na ugbua abụghị oge gọọmentị ga-etinye atụmatụ ga-eme ka ego kwụsị ịbata na Naịjirịa. Ụfọdụ naị ama ama akatọọla mkpebi gọọmentị etiti ịmachi bitcoin na cryptocurrency ndị ọzọ. Otu n'ime ha bụ Oby Ezekwesili onye bụbu mịnịsta agụmakwụkwọ na Naịjirịa Ezekwesili rụkwara ọrụ dịka otu n'ime ndị isi ụlọakụ mba ụwa bụ 'World Bank', ma sorokwa zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2019. N'ozi o zipụrụ n'akara Twitter ya, Ezekwesịlị kwuwu na gọọmentị gaara ịgba mbọ ịmụta etu cryptocurrency si arụ ọrụ kama ịmachi ya. Onye ọzọ kwuru okwu maka ya bụ Japhet Omojuwa, onye ode akwụkwọ nakwa onye nwere agba na soshal midịa. Omojuwa kwuru na mbọ niile gọọmentị sị na ha na-agba iji wulite akụnụba Naịjirịa akụọla afọ n'ala n'ihi mmachi a. Mana Boason Omofaye, onye ntaakụkọ bụ ọkachamara maka akụnụba, kwuru ọ gaghị ata ụlọakụ 'Central Bank' ụta maka ịmachi cryptocurrency. Omofaye kọwara na ọnọdụ akụnụba Naịjirịa esichaghị ike, ọ bịakwa bụrụ na enweghị ezigbo nhazi maka cryptocurrency. Ọtụtụ ndị ntorobịa Naịjirịa egosipụtala mwute ha dịka gọọmentị etiti machiri ụlọakụ dị icheiche ịnabata bitcoin na 'cryptocurrency' ndị ọzọ. Ụfọdụ n'ime ha na-ajụ na Twitter ma gọọmentị ọ chọziri ka ha mebe 'bitcow'? Nke a na-abịa dịka otu nwoke a ma ama na Twitter bụ Adamu Garba gwara ndị mmadụ ka ha wepụta ego ha na 'cryptocurrency' ma tinye ya n'ahị ịzụ ehi. Adamu Garba dekwara na ebe a nọ ugbua bụ CowtoCurrency. Nke a mere ndị ntorobịa ji ewe iwe ma na-ekwu na naanị ihe gọọmentị Naịjirịa na-akpachapụrụ anya bụ ihe gbasara ehi. Akintomide kwuru na ya ga amalitezi ịzụ ahịa ehi ebe ọ bụ naanị ahịa gọọmentị kwadoro @Marinebabe313 kwuru na ehi dị nnukwu mkpa na Naịjirịa nke mere e ji tinye ya n'akwụkwọ ego narị naịra abụọ Ụlọakụ etiti nke Naịjiria bụ Central Bank of Nigeria (CBN) na Bekee, amachiela ịzụ ahịa cryptocurrency na Naịjiria. CBN zipuru ozi mmachi a nye ụlọọrụ ndị na-ahụ maka akụnaụba n'ụbọchị Fraịde, dịka ha nyere ha iwu imechi ọbaego onye ọbụla na-azụ ahịa Bitcoin, Ethereum nakwa Dogecoin dị n'aka ha. Mmachi a mere ka ndị Naịjiria ọkachasị ndị ntorobịa na-eti mkpu na-ekwu na gọọmentị Naịjiria kwesịrị ị na-akwado cryptocurrency karịa ịchọ ụzọ ha ga-esi kpachie ya. Cheta na CBN dọburu ụlọakụnaụba ndị dị na Naịjiria aka na ntị n'afọ 2017 sị ha etinyela aka n'ihe gbasara ọzụzụ na orire ego ịntanetị dịka cryptocurrency, ruo mgbe a mara ihe e mere ya, ""n'ihi na ọ bụghị ezigbo ego dịka Naịra"". Ha kwuru mgbe ahụ na ha na-atụ ụjọ na ndị omekome nwereike iji cryptocurrency a ghọgbuo ndị Naịjiria ma gwuo ha wayo. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya: Etu ị ga-esi tinye ego gị na Bitcoin, Ethereum ka ọ ghara ịda mmiri Cryptocurrency, ọ kachasị nke a kpọrọ Bitcoin bụzi ihe onye ukwu na onye nta kpụ n'ọnụ taa gbasara okwu mmuba akụnụba nke Bekee kpọrọ 'investment'. Onye ntorobịa ọbụla ị kpara aka n'ọnụ ugbua, ọ sị gị na ya etinyela ego ya na Bitcoin. Bitcoin bụ ụdị ego anaghị ahụ anya; Bekee kpọrọ ya 'Digital Currency' maọbụ 'Virtual Currency' maọbụ 'Cryptocurrency'. E wepụ Bitcoin, ha dị ọtụtụ ụdị ego a e nwere. Ndị ọzọ niile ahụ ka a na-akpọ 'Altcoins'. Mana Bitcoin bụ nke ndị mmadụ kacha mara ma bụrụkwa nke kacha ọnụahịa. Otu mkpụrụ Bitcoin karịrị nde naịra anọ (N4 million) Ọ bụ n'afọ 2009 ka otu onye kpọrọ onwe ya Satoshi Nakamoto wepụtara atụmatụ Bitcoin, mana onweghị onye ma kpọmkwem onye nwoke ahụ bụ ruo taa. N'ihi na Bitcoin abụghị ego a na-ahụ anya, ọ bụ n'igwe kọmputa na ịntanetị ka e si ekesa ya. Onweghị gọọmentị mba ọbụla maọbụ ụlọakụ ọbụla na-ahazi etu e si eji Bitcoin azụahịa. Naanị ndị a na-akpọ 'Miners' bụ ndị na-emepụta ya ma na-ahazikwa etu e si eji ya azụkọrịta ahịa. Etu e si emepụta ụdị ya bụ usoro teknụzụ bụ ọgbaraIgbogharịị a na-akpọ 'Blockchain' na Bekee. Ịkọwa teknụzụ 'Blockchain' ga-abụ akụkọ nke aka ya. Nke a kpatara o ji dị mkpa na mmadụ ga-elezi anya nke ọma tupu o tinye ego ya na Bitcoin maọbụ 'cryptocurrency' ndị ọzọ, iji gbaara okwu na ụka ọsọ. Ọ dịchabeghị mfe mmadụ iji Bitcoin ga zụrụ ọgọdọ maọbụ akpa osikapa n'ahịa Naịjirịa, mana ihe e ji ya eme buru ibu. Nnyocha gosiri na Naịjirịa bụ mba a kacha e ji Bitcoin eme ihe na mpaghara Afrịka niile. Ihe e jikarị ya eme bụ ichekwaba ego nakwa iziga ego si otu mba gaa mba ọzọ. E nwere ụlọọrụ dị icheiche ọrụ ha bụ inyere ndị mmadụ aka ịzụta Bitcoin maọbụ ịgbanwe nke ha nwere nye ha naịra maọbụ dọla. Mana tupu itinye ego gị, anya saa. N'aka nke ọzọ, i nwere ike iji Bitcoin zụta ihe na mba dị icheiche dịka Japan, Switzerland, Germany, Singapore dịrị gawazie. Adedayo Adebajo, bụ onye ihe gbasara teknụzụ 'Blockchain' doro anya nke ọma, kọwaara BBC na tupu itinye ego na 'cryptocurrency': Ka ọ dị ugbua, onweghị iwu ọbụla machiri mmadụ itinye ego ya na Bitcoin maọbụ 'cryptocurrency' ndị ọzọ na Naịjirịa, mana onwekwaghị iwu ọbụla na-akwado ya. Ụlọakụ etiti bụ 'Central bank of Nigeria'dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha kpachapụ anya maka ego ndị a anaghị ahụ anya. Ha kwuru sị: ""Onweghi iwu ọbụla na-echekwa ndị ọbụla tinyere ego ha na 'cryptocurrency'. ""Anyị na-adọ ndị mmadụ aka na ntị na cryptocurrency abụghị usoro iwu kwadoro maka azụmahịa na Naịjirịa."" ""Onye ọbụla ego ya furu na cryptocurrency, onweghị ebe onye ahụ ga-aga mee mkpesa, ọ pụtara na ego ahụ alaala."" Mana ngalaba 'Securities and Exchange Commission' wepụtara akwụkwọ ozi n'ọnwa Sepụtemba nke na-ekwu na ha ga-amalite ịhazi cryptocurrency iji gbochie ndị mmadụ itufu ego ha. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-54327121 +health Ụzọ ọgbara ọhụrụ ise ị ga-eji hazinwu ọmụmụ gị Etu ihe si kwụrụ n'ụwa ugbua emeela ka ọtụtụ di na nwunye wetulata aka n'etu ha si amụ ụmụ ma ha lụchaa onwe ha. N'oge mbụ, di na nwunye na-amụtacha ụmụ ruru asatọ (8), iri na abụọ (12) maọbụ karịa mana nke ahụ bụzị akụkọ ifo makana ihe agbanweela. N'agbanyeghi ihe isi ike dị ugbua, ọ na-ewute ụfọdụ ụmụnwaanyị na ime na-aghọ ha na di ha aghọ (ime akpaghị akpa). Ụfọdụ gwara BBC Igbo na ha amaghị ụzọ maọbụ ọgwụ mgbochi ga-enyere ha aka ihazi ọmụmụ ha. Dọkịta na-ahụ maka ihe gbasara ahụike ime ahụ ụmụnwaanyị bụ dtk. Akinde Joseph gụpụtarala anyị ụzọ mgbochi ime ọghọm ruru isii, nke di na nwunye nwereike sị na ha ghọrọ nke dị ha ahụ mma. O kwuputekwara obere ọghọm sokwa ha. Mana onye ndụmọdụ na-ahụ maka nhazi ọmụmụ aha ya bụ Samuel, kwuru na ọghọm adịghị n'ụzọ ọhụrụ ndị a eji ahazi ọmụmụ, kama na ndịiche dị n'ahụ ụmụnwaanyị nwereike ime ka ihe gbanwetu ma bịaghachị etu ọ dị na mbụ ma otu maọbụ ọnwa abụọ gachaa. Dịka aha ya siri dị, a na-eyinye ya bụ okpu rọba n'amụ maọbụ n'ikpu tupu nwoke na nwaanyị enwee aramara. Dkt Akinde kwuru na e nwere okpunnabụenyi nke ụmụnwoke ma nwekwaa nke ụmụnwaanyị. O kwuru na okpunnabụenyi magburu onwe ya na mma makana ọị na-echete goolu ọfụma (ọ na-egbochi ịtụ ime) ruo pasenti iri itoolu na asatọ. Ọ na-enyekwa aka igbochi ọrịa a na-esikari n'aramara ebute. Ebe a na-enweta ya: Ị ga-enweta okpunnabụenyi n'ụlọ ahịa, ebe a na-ere ọgwụ maọbụ na nkịtị n'ụlọọrụ ndị na-ahụ maka nhazi ọmụmụ. Ọghọm Ọghọm na-adịkarị n'okpunnabụenyi nke ụmụnwoke bụ na ụfọdụ oge ha agaghị eyite ya ọfụma maọbụ aramara tọkụrụ ha, ha anyụọ n'ike tupu ha eyinye ya bụ ihe. Ọzọ bụ na ụfọdụ ụmụnwoke na-asị na ụtọ aramara anaghị aba ha ahụ maọbụrụ na ha eyighi okpunnabụenyi ọfụma. Nke a bụ ọgwụ a na-aṅụ aṅụ e si n'ụfọdụ kemikalụ na-edozi ahụ emepụta. A na-aṅụ ya kwa ụbọchị. Ọ na-egbochi afọ ime akwadoghị ọfụma. Ebe a na-enweta ya Dkt Akinde kwuru na ị ga-aga ahụ dọkịta ka ọ were aka ya nye gị. Ọghọm Ọ bụrụ na ị bụghị onye na aṅụkarị ọgwụ kwa ụbọchị, ị ga-enwe nsogbu makana ụbọchị ị na-aṅụghị ọgwụ mgbochi ya, afọ ime nwereike ịghọ gị dịka dkta Akinyemi si kwuo. 3. Ọgwụmgbochi eji ntụtụ agbanye Nke a bụ ọgwụmgbochi a na-eji ntụtụ agbanye n'ahụ kwa ọnwa atọ maọbụ abụọ ọbụla. Nwaanyị kwụsị igba ya, ọ ga-echeriri ruo ọnwa isii tupu ọ tụrụ ime. Ọ na-egbochi ntụrụ afọ ime. Ebe a na-enweta ya Dkt kwuru na ọ bụ dọkịta gị ga-eji aka ya gbaa gị ntụtụ a. Ọghọm Ọ na-eme ka nsỌ nwaanyị ghara ị na-apụta mgbe o kwesiri. Nke a bụ ụdịrị a na-ewere tinye n'ime ahụ ruo ogologo oge dịka afọ atọ maọbụ afọ ise. Dkt Akinde kwuru na anaghị eme ya eme ya dịka ọgwụmgbochi ndị ọzọ gụnyere na nwaanyị ga na-eme ihe dị na ya kwa ụbọchị. Itinye udiri a, ị gawara onwe gị ruo mgbe a ga-eji wepụ ya. Ọ na-egbochi afọ ime ọfụma ọfụma. Ebe a na-enweta ya A na-aga n'ụlọọgwụ ka dọkịta were aka ya tinye ya. Ọghọm Ị ga-echeriri ka ọnwa isii gafeecha iji wepụ ya tupu ị tụrụ ime. Ụfọdụ oge ọ na-eme ka nsọ nwaanyị dagharịa adagharịa. Nke a bụ obele igwe a na-tinye n'ime akpa nwa nke bekee kpọrọ (Intrauterine device). Ọ na-ahazi ọmụmụ ọfụma. Ebe a na-enweta ya A na-aga n'ụlọ ọgwụ, wara ya obere ahụ tupu dọkịta etinye ya n'ahụ. Ọghọm Ọ bụrụ na nwaanyị etinyere ihe a n'ahụ ya nwere nje n'ime ahụ ya, ọ ga-emetụta ọmụmụ ya n'ụzọ dị njọ. Ọ bụrụ na nke nwoke ya na nwunye ya na-edina nwere ọtụtụ ụmụnwaanyị nọ n'iro ya na ha na-eme aramara, ụzọ a agaghị adabachara nwunye ya ọfụma makana nwoke ahụ nwereike ibute nje n'ahụ ụmụnwaanyị ndị ọzọ ahụ. Dkt Akinde kwuru na nke a ga-eme ka ọgwụmgbochi nke akpa nwa merụọ nwunye nwoke ahụ ahụ. Ọ na-ebute nsọ nwaanyị ị na-agba karịa etu o kwesiri i si na-agba, mana ọ gaghị emete ya aka. Uzọ ndị a nwereike ịgbajọ gị Dkt Akinyemi kwuru na nwaanyị na-enye nwa sọsọ ara ruo ọnwa isii ka ọ mụchara nwa ọhụrụ nwereike ịlafere itụrụ ime ọghọm. Mana ọ gafee ọnwa isii ahụ o ji mụchaa nwa ọhụrụ, ọ ga-atụrụ ma ọ mee aramara. Dọkịta Akinde kwuru na tupu nwoke na nwaanyị ya ahọrọ nhazi ọmụmụ ọbụla ọ ga-adị mma ka ha na dọkịta na-ahụ maka ime ahụ nwaanyị na ọmụmụ kpaa maka ya. Onye ndụmọdụ nhazi ọmụmụ aha ya bụ Samuel kwuru na ụzọ ndị ọhụrụ eji ahazi ọmụmụ na-arụrụ ọrụ ruo paseenti 98 maọbụ 96. O kwukwara na ọ dị mma ka ụmụnwaanyị chere ruo abali asaa ha ji mechaa nhazi uzọ ọhụrụ ndị a tupu ha emewe aramara. N'ikpeazu, ụfọdụ ndị ekwenyeghị n'ụzọ ọhụrụ ndị a eji ahazi ọmụmụ mana onye ndụmọdụ Samuel na-ekwu na e kwesighị ịgbagha nhazị ndị a makana ọ naghị egbochi nwaanyị itụrụ ime kama ha na-ahazị ọmụmụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-53712149 +business Etu nsogbu iweta ego dọla ga-esi metụta gị na azụmahịa gị Dịka ego dọla dị ụkọ ugbua na Naịjirịa, ụfọdụ ụlọakụ amalitela itinye mmachị ka ndị mmadụ ghara iji ọbaego Naịra ha zụta ihe maọbụ mee azụmahịa ọbụla nke metụtara ego dọla. Cheta na e nwegbuola mgbe gọọmentị Naịjirịa tinyere iwu na naanị ego dọla iri abụọ ($20) ka ndị mmadụ ga-enweike iji zụọ ahịa n’ọbaego Naịra ha n’otu ọnwa. Dịka a na-atụ anya na e nwereike inwe mmachị ndị ọzọ nyiri nke a, kedụ ka iwu ndị a ga-esị metụta gị? Iji dọla kwụọ ụgwọ n’ịntanetị agaghịzị adị mfe: Ụfọdụ ihe obere ego nke ndị mmadụ na-ejibu ọnụego dọla iri abụọ azụta n’ịntanetị agaghịzị abụ ihe ga-ekwe omume. Dịka iwu ndị ọzọ kpachịrị iji dọla zụọ ahịa na-amụbanwanye, ndị ahịa na-atụbata ibu ga-enwezi nsogbu n’azụmahịa ha n’ihi ọtụtụ ihe ha na-ere na Naịjịrịa na-esi mba ofesi abata. Nke a gụnyekwara ndị na-eji ego ịntanetị nke a na-akpọ ‘Cyrptocurrency’ azụ ahịa. Ime njem gaa ofesi: Dịka ọtụtụ ndị bi na Naịjirịa na-apụ maka njem nlereanya, agụmakwụkwọ, ịmalaite ọrụ na mba ofesi maọbụ ọpụpụ n’ihi na ha achọghịzị ibi na Naịjirịa, ime njem gaa mba ofesi nwereike ịkwụsịtụ. Otu nwaamadị na-arụ ọrụ n’ụlọakụ ukwu Naịjirịa na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na nke a bụ n’ihi ọtụtụ ụlọọrụ ụgbọelụ na-arụ ọrụ na Naịjirịa bụ nke mba ofesi – Nke a pụtara na ha na-ezipụ ego dọla mana n’ihi iwu ndị ụlọakụ ukwu Naịjirịa tinyerela, ime nke a adịghịzị mfe. Na nso nso a, minista na-ahụ maka njem ụgbọelu Naịjirịa bụ Hadi Sirika kwuru na ndị ọrụ ụgbọelu ọbụla e jidere na-ana ndị njem ego dọla ga-anata ntaramahụhụ dịịrị ha. Agụmakwụkwọ: Ụmụafọ Naịjirịa na-aga mba ofesi aghara aghara maka agụmakwụkwọ ha ọkachasị dịka otu ndị nkuzi mahadum bụ Asuu na-eme abụbụọrụ kemgbe. Iwu mmachị iji ego dọla zụọ ahịa na Naịjirịa nwereike imetụta ụmụakwụkwọ na-achọ izipụ ego ụgwọ akwụkwọ ha dịka nke a agaghịzị adị mfe, nke a so n’ihe onye otu nwoke ọzọ aha ya bụ Amara na-arụbu n’ụlọakụ Naịjriịa kọwara BBC Igbo. Ụgwọ Naịjirịa ji mba ndị ọzọ: Naịjirịa ebirila ọtụtụ ego n’aka mba ndị ọzọ na nso nso a n’ihi ndakpo akụnụba ha, nke a sokwa akwanye ọkụ na nsogbu ego dọla Naịjria na-enwe. Gọọmentị na-ekwu na ha na-eji ego ndị a arụ ọrụ mmepe obodo. Nwaamadị ahụ na-arụ n’ụlọakụ ukwu Naịjirịa na-achọghị  ka a kpọọ aha ya kwukwara na ọ bụ ọtụtụ ihe jịkọrọ aka ọnụ na-akpata nsogbu ndị a. Ọnụego mmanụ agbịdị n’ụwa: Dịka agha Russia na Ukraine ka na-aga n’ihu, mba Russia so na mba kacha emepụta mmanụ agbịdị n’ụwa danyere n’ọnọdụ mere ka mmepụta nakwa ọnụego mmanụ agbịdị ha ria elu. Nke a pụtara na mmepụta mmanụ agbịdị ha anaghịzị ezu obodo ndị chọrọ ịzụ ya. Nke a mekwara ka ọnụ ego mmanụ agbịdị rielu. Dịka nwaamadị ahụ siri kwuo, Naịjirịa na-emepụta mmanụ agbịdị na-eresi ndị mba ofesi. Ego dọla bụ ego Naịjirịa ji azụ ahịa na ihe ọbụla metụtara mba ofesi ndị ọzọ. Ihe ọbụla metụtara dọla na-emetụta azụmahịa nakwa akụnụba Naịjirịa. Nsogbu Naịjịrịa na-enwe na mmepụta mmanụ agbịdị: Dịka nwaamadị ọkaibe n’ihe gbasara ego siri kwuo, Naịjirịa na-eresi ndị mba ọzọ mmanụ agbịdị n’ọnụego dọla. Izu ohi mmanụ agbịdị na-emetụta mmanụ agbịdị Naịjịrịa na-emepụta. Chetakwa na Naịjịrịa enweghị ụlọọrụ ebe a na-agbanwe mmanụ agbịdị nke Bekee na-akpọ ‘Refinery’, nke sokwa na-enye Naịjirịa nsogbu na mmepụta mmanụ agbịdị bara ụba. Nchepụta ụzọ ndị ọzọ eji emepụta ọkụ latrịk na mmanụ ụgbọala: Ọtụtụ mba ụwa anaghịzị iji mmanụ agbịdị emepụta ọkụ latrịk ha nwezịrị ụzọ ndị ọzọ nke a na-akpọ 'alternative energy' na Bekee. Nke a gụnyere: ‘wind energy’, 'solar energy' ‘nuclear power plants’ ‘green energy’ wdgz. Na nchịkọta, Naịjirịa enweghịzị ọtụtụ ego dọla etu ọdịbụ na mbụ ọkachasị n’ọbaego ha nke a na-akpọ ‘Foreign reserve’ n  Bekee. Nke a mere gọọmentị ji emepụta iwu dị iche iche nakwa ụzọ ndị aga eji mee ka ọnụego dọla ga-eji daa n’ebe Naịra nọ. https://www.bbc.com/igbo/articles/c9en5jzmrgzo +entertainment Igbaegwuregwu Masquerade: Etu mmọnwụ Igbaegwuregwu si egbochi ụmụokoroọbịa ime mpụ n'obodo "Mmọnwụ Igbaegwuregwu e hiwere n'ọgbọ afọ 1940 bụ maka iji nye ndị mmadụ obi aṅụrị nakwa ime ka ndị ntoroọbịa sepu aka na mpụ dị iche iche. Ọ bụ otu mmọnwụ na-agbakaarị egwu n'oge emume dị iche iche n'Anambra Steetị. Mana ugbua, ọ dị ka a ga-asị na ọgbara ọhụrụ ewerela ọnọdụ nke mere ka ọ bụrụ naanị otu ọgbọ n'obodo Umuchu dị n'Anambra Steetị na-eti ya bụ mmọnwụ. Ụfọdụ ndị so n'otu mmụnwọ a kọwaara BBC Igbo ihe Igbaegwuregwu bụ nye ha nakwa etu o si akpalite mmụọ ha. Ha gosikwara etu e si eti ya bụ mmọnwụ Igbaegwuregwu site n'iti ịgba nakwa ite egwu ọdịnala na-eso ya. Otu onye okenye so n'otu ahụ kọwakwara etu mmọnwụ Igbaegwuregwu si malite nakwa uru ọ bara n'obodo nke gụnyere ime ka ndị ntoroọbịa sepu aka n'ime mpụ. Gịnị bụ Igbaegwuregwu? Otu onye okenye so n'otu Igbaegwuregwu bụ Nze Pius, sị na ọ bụ mmọnwụ a malitere iti n'afọ 1943, n'obodo Nise dị n'Anambra Steetị ma gbasawa n'obodo ndị ọzọ. Ọ sị na mgbe ndị nna nna ya tiri mmọnwụ Igbaegwuregwu na ọ dị mmọnwụ asaa dị n'obodo dị iche iche dịka Nise, Umuchu, Awkuzu na ndị ọzọ. Nze Pius sị na aha e ji maara onye na-eyi mmọnwụ ahụ n'onwe ya bụ 'Chinelo' ""Mgbe ọbụla e tiri mmọnwụ a, ihe a na-ele anya bụ ma Chinelo ọ pụtala n'ọgbọ?"" Ọ sị n'ime obodo asaa ahụ na ọ bụ naanị Umuchu ka na-eti mmọnwụ Igbaegwuregwu. ""Mgbe m gara Awkuzu iti mmọnwụ Igbaegwuregwu, a sị m na ọ dịghịzi ugbua"". Ọ kọwara na ọ bụ naanị ndị nwoke na-eti mmọnwụ a dịka ha si mụta n'aka ndị nna nna ha ochie. Otu nwokoroọbịa a kpọrọ Nze Ogbuefi so n'otu a sị na mmọnwụ Igbaegwuregwu na-eme ha obi ụtọ, ịdị n'otu nakwa ịmụta ihe n'aka ndị okenye. Kirie ihe ha kwuru n'uju;" https://www.bbc.com/igbo/afirika-61132800 +entertainment Erica Nlewedim: 'M nweta ohere ịlaghachị ụlọ 'Big Brother' agaghị m aṅụbiga mmanya oke' """M nweta ohere ịlaghachị ụlọ 'Big Brother' agaghị m aṅụbiga mmanya oke."" Nke a bụ okwu si n'ọnụ Ngozi Nlewedim e ji Erica mara n'ụlọ Big Brother Naija nke afọ 2020. Erica gwara BBC Igbo ihe bụ nnukwu mwute ya gbasara emume ahụ o so wee mee nke a chụpụrụ ya na ya n'ihi ịkparị Laycon bụ onye otu ya. O kwutukwara maka Laycon nakwa etu ọyị ya na Kiddwaya sokwa mee emume ahụ si aga ugbua ha niile pụtarala n'ụlọ ahụ. Gere ihe o kwuru n'uju ebe a dịka ihu ya bu sọ ọchị. Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo na Chimezie Ucheagbo." https://www.bbc.com/igbo/media-54329865 +health Coronavirus: 'Mmadụ 30 ga-anwụ tupu m kweta na ọrịa a dị na Naịjirịa' Site n'ime ụlọọgwụ pụrụiche maka ọgwụgwọ ndị bu ọrịa a rue n'okporoụzọ, echiche ndị mmadụ dị iche. Ụfọdụ dịka ndị na-agwọ ndị bu ọrịa na-akwa arịrị maka etu ndị mmadụ si anwụ n'aka ọrịa. N'aka nke ọzọ ndị mmadụ agbara ajụjụ ọnụ n'okporoụzọ na-ekwu na ọrịa ahụ adịghị ya chaachaa. Lee okwu ha n'uju ebe a: https://www.bbc.com/igbo/media-53370800 +politics Nnamdi Kanu Trial: DSS ekweghi ka Kanu binye aka n'akwụkwọ enyemaka nke mba UK - Alloy Ejimakor "Okwu ọhụrụ dapụtara n'ikpe Nnamdi Kanu na-ekwu na ndị Department of State Service (DSS) bụ ndị ji ya ekweghi ya binye aka n'akwụkwọ ga-eme ka mba Briten nye ya enyemaka. Nke a pụtara ihe n'ozi ọkaiwu ya bụ Alloy Ejimakor ziputara n'ụbọchị Monde. O kwuru ""e nyeghachiri m akwụkwọ enyemaka nke ga-eme ka mba Briten nyere Kanu aka ebe Kanu emetụtaghị ya aka"" ""Ka m kwuo n'ezie, e nyere m ndị DSS akwụkwọ a kemgbe abalị ole na ole gara aga, ha kwetakwara na ha ga-enye ya Nnamdi Kanu Mana ndị ọkaiwu DSS enyeghi ikike ka Kanu binye aka n'akwụkwọ ahụ n'ihi ihe ma amaghị rue ugbua"" ka Ejimakor dere. Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghi ihe nrite ọ hụrụ gọọmentị etiti ga-enweta n'ime nke a. ""Kama ihe ọ ga-eme bụ na ọ ga-egosi na gọọmentị Naịjirịa ma ụma agbachi enyemaka mba Briten irute Nnamdi Kanu aka"" O kporo okua ka ụlọ nnọchianaya nke mba Briten mee ngwa ngwa nyere Nnamdi Kanu enyemaka ruru ya dịka onye ala ahụ nke Kanu bụ. Ha mee nke a, ọ ga-eme ka Nnamdi Kanu nwee mmekọ mmadụ na ibe ya maka na ugbua, ọ bụ naanị ndị ọkaiwu ya nwere ikike ịleta ya. BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru DSS bụ Peter Afunanya mana ọ sị ka edetere ya ozi maka na ọ nọ na nzukọ. Ruo oge akụkọ a pụtara Maazị Afunanya azabeghị ka o siri kwụrụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57891656 +politics Economic Advisory Council: 'Ihe mbụ ha ga-eme bụ ịgwa Buhari ebe ọ dajọrọ - Ezekwesili "Oby Ezekwesili etoola onyeisiala Muhammadu Buhari maka ihiwe ngalaba ndị ndụmọdụ nhazi akụnaụba nke ndị ọkachara mara n'okwu akụnaụba so n'ime ya ma rịọ ndị ọ họọ ọrụ ka ha gwa ya eziokwu na ""ọ kụdara akụnaụba Naijiria n'afọ anọ gara aga."" Na mbido izu a, Buhari hiwere otu ndụmọdụ ọhụrụ maka akụnaụba a kpọrọ 'Economic Advisory Council' nke onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti bụ Charles Soludo na onyeisi 'Financial Derivatives Co. Ltd' bụ Bismark Rewane, so na ya. N'okwu o depụtara n'akara 'Twitter' ya, Ezekwesili, kwuru na ọ ga-adị mma ma ndị a ụbụrụ ha na-acha ọkụ Buhari họrọ n'ọrụ ""hapụ ikpọ isi ala na ndị otimkpu, gwaa Buhari nke bụ eziokwu nke ọ ga-abụ a gbasoo ya, akụnaụba Naijiria agawa n'ihu"". Ezekwesili, onye rụburu ọrụ dịka onyeisi ngalaba nhazi mmefu ego na gọọmenti a kpọrọ 'Due Proces', kwuru na nhọpụta ọhụrụ a chịkọtara ihe atọ; 1. Ndị ọchịchị kachasị 2. Ndị ọkachamara imeụlọ 3. Nakwa ndị ụburu ha na-achọ ọkụ n'o n'ama, ọnụna ndị ụbụrụ Ezekwesili gara n'ihu gwa ndị na-ata osote onyeisiala Yemi Osinajo ụta maka etu akụnaụba Naijiria siri kpụọ afọ n'ala na ọbụghị Osibanjo nyụrụ ihe na-esi. Otu a bụ nke onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti bụ Charles Soludo so na ya ga-anọchi anya otu Economic Management Team nke osote onyeisiala Osinbajo bụbu onyeisioche ya. Onyeisioche otu a bụ ọkammụta Doyin Salami, ndị ọzọ bụ Mohammed Sagagi osote onyeisioche, Shehu Yahaya, Iyabo Masha, Bismark Rewane, Mohammed Adaya Salisu. Femi Adesina bụ onye ndụmọdụ pụrụiche Buhari na mgbasaozi sị na ndị a ga-enye onyeisiala ndụmọdụ banyere ime iwu akụnaụba Naịjirịa. Ndị uweojii na Port Hacourt anwụchiela mmadụ abụọ maka ogbugbu a na-egbu ụmụ agbọghọ n'ụlọ oriri na nkwari na Potakọt. Na nsonso a, a tọgburu opekatampe ụmụagbọghọ asatọ na ndịda Naịjirịa kemgbe ọnwa Julai. N'otu aka ahụ ndị uweojii kwukwara na akụkọ ụmụ nwaanyị abụọ ọzọ atọgburu n'ụlọoriri abụghị eziokwu Ha kwuru nke a dịka ụmụnwaanyị mere ngagharị iwe gbasara oke ogbugbu a na-egbu ụmụ agbọghọbịa n'ụlọoriri n'obodo ahụ. Ụgboelu Airpeace kwesiri ịga bulata ụmụ Naịjirịa ọzọ site na mba Saụt Afrịka na mgbede taa bụ Tuzde efenyighizi oge a tụrụ anya n'ihi Saut Afrịka enyeghị ha ikike ifebata. Mana Onyeisi Airpeace Allen Onyema gwara BBC na ha enwetala ya bụ ikike nakwa na ha ga-aga mba Saut Afrịka nata n'ụbọchị Wenezde. Peter tabichi bụ onye nkuzi Kenya ritere nzere ""onye nkuzi ọkaibe na mbaụwa na 2019 "" ezutela onyeisiala mba Amerịka bụ Donlald Trump n'obi gọọmentị mba ahụ Tabichi onye chiri Franciscan Brother' na-eji pasentị iri asatọ n'ụgwọ ọnwa ya akwado ụmụakwụkwọ ya Otu ICPC ejichiela akụnaụba Amaju Pinnick na ndị ọrụ NFF ndị ọzọ dịka ha na-enyocha ha maka nrụrụaka Rasheedat Okoduwa na-ekwuchitere ICPC kwuru a na-enyocha ndị a n'ihi na ihe ndị ha nwere karịrị ụgwọ a na-akwụ ha. Gọvanọ Ugwuanyi agbapela okporoụzọ ọhụrụ Gọvanọ Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi agbapela okporoụzọ si Ikem gawa Eha Amufu nakwa Nkalagu dị n'okpuruọchịchị Isi-Uzo Enugwu steeti. Okporoụzọ a dị kilomita asatọ na ụma bụ ebe e si a ga n'ụlọọrụ Sịmentị Naịjirịa bụ Nigercem nakwa gawa mpaghara ugwu. N'ofesi: Mba Izrel na-eme ntuliaka ha nke ugboro abụọ n'ime ọnwa ise ebe Pati ndị kachasị obere nwereike ikpebi ihe ga-eme. Onyeisiala ha Benjamin Netanyahu kpọrọ oku ka e me ntuliaka ọzọ makana ọ hụghi ndị ya na ha ga-eso hazie gọọmentị dịka o merichara ntuliaka n'ọnwa Eprel N'egwurgwu Asọmpi bọọlụ kachasị na Yurope bụ Uefa Champions League nke afọ 2019/2020 ga-atabiri ọkụ taa n'elekere asatọ nke abalị a. Cheta na otu egwuregwu Liverpool maburu iko asọmpi a n'afọ gara aga. Nkeji: Ihe nkiri:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49725362 +business Igbo cuisine: Ana m amalite ọrụ n'elekere atọ nke ụtụtụ - Onye Abacha Ndị na-atụ mgbere n'ahịa Ladipo ma Grace Igwe dịka onye na-ere abacha. Mana ọ bụghị sọsọ ihe nwaagbọghọ ahụ na-eme. Nwa ada Igwe sị na olileanya ya bụ ịgụ egwu, ma gakwaa mahadum ga mụọ atụmatụ egwu. Iji mezuo ihe a, ọ na-ere abacha iji kpata ego. Ọ sị na nne na nna ya na-akwado ya ọfụma. O kwukwara na agbanyeghị na ụmụnwoke na-enye ya nsogbu, uche ya dị n'ihe ọ chọrọ bụ ịbarụ onwe ya uru. Kirie ihe onyonyo a ka ị mata ya n'uju: https://www.bbc.com/igbo/afirika-49043504 +business CBN BDC: 'Mmachị Bureau De Change ga-ebutere anyị agụrụ' - Onye na-agbanwe ego Ndị na-agbanwe ego akpọrọ Bureau de Change na bekee na Najirịa na-akwa arịrị gbasara etu gọọmenti etiti si machie iresi ha ego mba ofesi ụnyahụ. Chukwuemeka Arinze bụ onye na-agbanwe ego na Legọs kamgbe afọ iri abụọ kwuru na mmachị a ga-akwanye ya na ndị otu ya na-emekwa udiri azụmahịa ahụ n’agụrụ ma mee ka ọtụtụ ndị ha na-enye ọrụ laa ụlọ ga-anọdụ ala. Cheta na ụlọakụ ukwu NaỊjiria bụ “Central Bank of Nigeria” kwuru na ha machiela iresi ndị na-agbanwe ego, ego mba ofesi ọbụla. Gịnị kpatara mmachị a? CBN kwuru na ọ bụ maka etu ndị nkịtị na-agbanwe ego si eji ohere e nyere ha were na-akwado nrụrụaka ego dị iche iche. Onyeisi CBN bụ Godwin Emefiele kwuputere nke a ụbọchị Tusde(Julaị 27,2021) ma kwukwa na CBN agaghị enyezi ndị mmadụ akwụkwọ ikike e ji agbanwe ego na Naịjirịa. Emefiele kwuru na CBN ga na-eresizi ụlọakụ dị ịche iche na Naịjirịa ego mba ofesi. O kwuru na ọtụtụ ngalaba mba ofesi kụpụrụ nti gbasara ime mgbanwe ego iwu akwadoghị. Ihe gọvanọ CBN kwesiri ime karịa ma ịmachị iresi ndị BDC ego mba ofesi Arinze bụ onye na-eme mgbanwe ego kwuru na CBN kwesiri itinyekwu ego n’ahịa mgbanwe ego karịa ma ịmachị ndị nkịtị ime ya. O kwuru na ndị otu ya ahụghị ego mba ofesi zuruoke ha na-eresi ọtụtụ ndị na-agbanwe ego n’aka ha ma ya fọdụzie iji ohere ha mee nrụrụ aka. Arinze kwuru na ọ dị mma etu CBN si kwuo na ha ga-akwụsị inye ndị na-achọ akwụkwo ikike ọhụrụ ime mgbanwe ego. Ihe ndị ọzọ ọ kọwara dị n'ihe nkiri a dị ebe a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-57994535 +politics Emeka Ihedioha : Anyị niile bụ nwanne na PDP "Gọvanọ Imo steeti bụ Emeka Ihedioha ekwuola na otu PDP na steeti ka bụ otu n'agbanyeghị mpụtara ikpe Ụlọikpe Kachasị na Naịjirịa nyere gbasara onye ji ọkọlọtọ pati ahụ na ntuliaka 2019. Ulọikpe kachasi na Naịjirịa nọrọ ụbọchị Tuzde kpebie na ikpe amaghị Ihedioha n'akwụkwọ nke Senetọ Samuel Anyanwu gbara nke o boro ebubo na PDP Imo steeti họputa Ihedioha n'ụzọ ezighị ezi ịzọ oche gọvanọ Imo steeti. Ihedioha egosiri obi ụtọ ya na mmeri nke Ụlọikpe Kachasị nyere ya ma rịọ ka ndị Imo steeti niile, n' agbanyeghị otu ndorọndọro ọchichị onye nọ na ya, gbakọta bia tinye aka ka ha dozie Imo steeti. N'okwu ya site n'ọnụ onye nnyemaka pụrụ iche n'ihe gbasara mgbasaozi nke Gọvanọ Ihedioha bụ Steve Osuji, o kwuru na ""na-agbanyeghị na ha nabatara ikpe a, na ihe mere bụ n'etiti umunne."" ""Anyị bụ otu n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP."" O kwukwara na ha nwere olileanya na ikpe agaghị ama ha na akwụkwọ niile a gbara ha ka dị n' ụloikpe. Ebubo a bidoro dịka Ihedioha jiri votu 1,723 were merie Anyanwu onye nwetara 1,282 n'onwa Oktoba n'afọ 2018 mgbe ndị PDP nke Imo steeti mere nhọputa. Onye ọkaikpe John Okoro kara ikpe a were si ""onye gbara akwụkwọ enweghị ike igosi na ebubo ya bụ eziokwu nke mere na ikpe ya esighị ike"" O kwukwara na ""Onye gbara akwụkwọ ga akwụ kwa onye ọ gbara akụkwọ N200,000 """ https://www.bbc.com/igbo/afirika-49173023 +politics "Ernest Ezeajughi, bụbu 'Mayor' na London aghọọla ""Chief of Staff"" Soludo" "Ernest Ezeajughi bụbu ""Mayor na London"" esorola ọchịchị Anambra steeti dịka onye nchịkọta ndị ọrụ oyibo a kpọrọ ""Chief of Staff"" na Bekee. Ezeajughi so na mmadụ atọ ndị ọzọ Gọvanọ Soludo kpọpụtara ụnyaahụ bụ Mọnde dịka ndị ga-enyere ya aka n'ọrụ. Ndị ọzọ bụ Richard Nwora Madiebo bụ onyeisioche ịchụ nta ego a kpọrọ Anambra State Internal Revenue Service. Onye nke atọ bụru AVM Ben Chiobi bụ onye ndụmọdụ Gọvanọ n'ọrụ nchekwa. Ernest Ezeajughi, bụbu 'Mayor' na London agba nke abụọ ya Ji awayị tọọ ụtọ, awanye kwuo ya ji! Otu nwa afọ Igbo ji eje mba bụ Ernest Ezeajughị abụrụla 'Mayor' nke Brent dị na mba Briten agba nke abụọ ya. Ernest Ezeajụghị nwetaburu ọkwa ahụ nke mbụ ya n'ụbọchị nke mbụ nke ọnwa May afọ 2019 na Brent Civic Centre. N'ozi ekele nke Willie Obiano bụ gọvanọ Anambra steeti wepụtara, O kwuru na ihe Ezeajughị mere gosiri na 'Anambara steeti bụ ''ihe nke ala Naijiria"" n'ezie. Ozi ahụ nke Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ Don Adinuba binyere aka, Ọ sị ""nhọpụta a họpụtagharịrị Ezeajughi bụ ihe akaebe na ọ rụrụ ndị Brent ezi ọrụ n'agba mbụ ya."" Onye Ọgbụ n'Anambara steeti, Ernest Ezeajughị gara mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka Anambara steeti tupu ọ gawa ala Bekee ga biri. Ezeajughi kwuru na ọ bụ nna ya gwara ya ka ọ sonye na ndọrọndọrọ ọchịchị n'ime obodo ma kwe nkwa na ọ ga-atụkọta ego iji nyere ndị na-arụ ọrụ n'efu. Ọ ga-achị site n'afọ 2019 ruo afọ 2020. Ma ọ ka na-akwalite ọkọlọtọ Naịjirịa elu ebe ọ nọ. Ihe ise ị na-amaghị maka Ezeajụghị (Mayor Igbo ndị Brent) Mana dịka a na-enwe anụrị maka ọkwa ọhụrụ Ezeajughi wetere, n'okwu ọzọ ihu gbaruru agbaru. Nwaanyị mba Naịjirịa bụ Fiona Onasanya abụrụla onye mbụ a ga-eji akwụkwọ ngosi iwe akpọrọ ""recall petition"" wepụkwa ya n'oche dịka onye omeiwu na-anọchite anya Peterborough. A kpọchịrị Onasanya onye dị afọ iri atọ na ise na nga n'ọnwa January 2019 maka itụ asị gbasara ịgba oke ọsọ n'ịnya ụgbọala. Ọ bụ onye mbụ na-enweta akwụkwọ ngosi mkpesa na mba England." https://www.bbc.com/igbo/afirika-48135422 +entertainment Bobrisky: Ọ lụrụ ọgụ ka nwoke ka-e suru ụgbọala ya? Onye a ma ama maka iyi efe ma na-etecha ntecha ụmụnwaanyị bụ Bobrisky egosila ihe o ji bụrụ dimkpa site n'ịlụsa nwoke suru ụgbọala ya ọgụ. Bobrisky, onye ezigbo aha ya bụ Idris Olarenwaju, depụtara n'akara Twitter ya na ya gakwaara onwe ya ọgbakọ mgbe nwoke ahụ ji ụgbọala ya suo nke ya. Mana Idris kwuru na okwu bidoro mgbe nwoke ahụ bidoro mawa ya aka n'ihu jụwa ihe ọ pụrụ ime ya. O kwuru na o mesiri nwoke ahụ ike ma gosi ya na ọ bụghị ya ka a na-amara aka. Gụọ ihe o dere n'uju ebe a. Nwoke ahụ agbarala ọsọ rịọ Bobrisky mgbahara. Ụmụ mmadụ na-ekwu ọtụtụ ihe maka ihe mere na soshal midia. @Blessyn_coco kwuru na isi ndo ezughi. @Haryordeylaymi kwuru na ihe a gbagọjuru ya anya. Bobrisky bụbu nwoke mana ọ na-ekwusi ike na ya bụzi nwanyị ugbua. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50114925 +politics Chukwuma Soludo: Ihe ndị Anambra chọrọ n'aka Gọvanọ ọhụrụ ha Ụlọọrụ Inec akpọpụtala aha Chukwuma Soludo dịka Gọvanọ ọhụrụ Anambra steeti. N'ihi nke a, o nwere ọtụtụ ihe chere Soludo aka mgba. Mana gịnị ka ndị Anambra chọrọ n'aka ya? https://www.bbc.com/igbo/afirika-59250840 +business Ogba mbọ: 'Etu m si eji nsị mmadụ na anụmanụ emepụta gaasị e ji esi nri Prince Obioma dị afọ iri atọ na abụọ si Imo steeti na-agbanwe ureure wee mepụta gaasị017880 e ji esi nri. Ọ gwara BBC Igbo na ọ gara mba Kenya ga mụọ ya bụ atụmaatụ ọfụma. O kwuru na Biogas ga-enyere gị aka ka ịghara na-awụsa ureure na bee gị etu ọbụla o si sọọ gị. Obioma kwuru na biogas anaghị agbawa dịka gasi si na mmanụ agbịdị. Gere ya n'uju ebe a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-54884121 +health Dibia bekee: Kwụsịnụ iṅụ akpụrụachịa Ọtụtụ ndị mmadụ na-eche na ọ bụ mgbe ị ṅụrụ mmanya ọkụ karịa otu karama ka ị ga-adaba na nsogbu. Mana ndị dibia bekee ekwuola na o nwere mmanya ọkụ na-ekwesịghị ịba mmadụ ọnụ. Ufọdụ ndị BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwuru na aha a na-enye mmanya ọkụ a na-ere n'akụkụ ụzọ akpọrọ akụrụ akụ n'atọ ọchị. Ha gụnyere akpụrụachịa, energy 2000, kerewa, fonofiri, kparaga, ogidiga, Ibile, baby ọkụ, Kogbebe, monkey shoulder, koboko, dadubule, apoko, gallant, pasa bitters, osomo, orimalu, nakwa durosoke. Ọ pụtara na mmanya ọkụ adighị mma? Otu dibia bekee akpọrọ Darlington Akahara, gwara BBC Igbo na mmanya ọkụ nwere oke ga abụ ị ṅụọ ya o dozie ahụ, oke ahụ bụ pasentị abụọ na ọkara. Ọ dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ gbaara ụmụ mmanya ọkụ akpọrọ akpụrụachịa ọsọ, maka na ngwongwo dị na ya na-egbu umeji anụ. Ọ kọwara ihe kpatara akpụrụachia ji dị njọ. Gere ihe o kwuru n'uju ebe a. Otu ihe si kwuru ụgbụa, ọ dị oke mkpa ka ndị isi oche leba anya na mgbalite mmanya ike nke gazugoro ala Naijirịa. Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka nri na ọgwụ akpọrọ NAFDAC ekwuola na pasentị iri asatọ mmanya ọkụ eji ahihia mepụta adịghị nma n'ahụ maka na ọ na-eripiasị ụfọdụ akụkụ ahụ mmadụ. https://www.bbc.com/igbo/43085664 +politics "Abia Poly sack: ""Gọọmenti chọrọ ikpuchi nchọpụta ndị omeiwu mere"" - Cmdr. Nwachukwu Chukwu" "Comrade Nwachukwu Chukwu bụ onyeisioche ndị otu Senior Staff Association nke Politekinik Abia steeti ekwuola na obi adighị ndị ọrụ mma maka ọchụchụ mberede gọọmenti chụrụ ndị ọrụ ha. Chukwu onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC sị na gọọmenti chọrọ ịchụ ndị ọrụ eji ụgwọ ọnwa iri na isii. Ọ sị na ha nọ na ụbọchị Wenezde mgbe ndị uweojii dị iri na atọ (13) bucha egbe batara ụlọakwụkwọ iyi ndị mmadụ egwụ. Mgbe ha gara ịjụ ndị isiụlọakwụkwọ ihe mere ndị uweojii jiri kpojuo ụlọakwụkwọ ha, ndị isi gwara ha na onwere ndị achọrọ ichụ n'ọrụ. Chukwu kwuru na onwere ihe gọọmenti na-ekpuchi nke mere ha ji bia ịwakpo ụlọakwụkwọ ahụ tupu nchọpụta ndị ụlọomeiwu mere apụta. Ọ sị na ndị ụlọomeiwu nọ ọrụ nchọpụta n'Abia Poly kemgbe ọnwa Julaị afọ a mana gọọmenti echeghị ka nchọpụta ha pụta ihe. N'uche ya, kọmitii ndị omeiwu chọpụtara ọtụtụ ihe mkpughe nke gọọmenti achọghị ka ọ pụta ihe. Ugbua, ndị ọrụ niile n'Abia Poly gbara ọsọ ndụ ka ndị uweojii ghara ịmeru ha ahụ, dịka Nwachukwu si kwuo. Ọ sị na 'ndị isi otu anyị nọ n'ọsọ ndụ maka egwụ a na-eyi ha"". Ọ sịkwa na ha na-agagharị ịkpesara ndị otu ha dị icheiche dịka ndị ""Nigeria Labou Congress"" ka ha gbatara ha ọsọ enwemaka ma gbaziere ha ụzọ otu ha ga-esi mee ka gọọmenti gee ha nti. Chukwu kwuru na ọnweghị ihe dị njọ ịchụ ndị ọrụ mgbe gọọmenti chọpụtara na ha agaghị akwuli ha ụgwọ, kama na ekwesiri ịkpa ya akpa. Ọ sị na ọbụghị maka asambodo adigboroja ka e ji chụọ ndị ahụ n'ọrụ maka na oteelarị achụchara ndị ji asambodo adịgboroja nke ụfọdụ n'ime ha bụ ndị e mechara kpọhachite azụ. Mana onyeisi ọrụ nta akụkọ gọvanọ Abịa steeti bụ Onyebuchi Ememanka gwara BBC na ya bụ oke mmiri ruwere kemgbe 2015. Ememenka kwuru na ndị na-arụ ọrụ na ya bụ ụlọakwụkwọ kariri ego ha na-arụta. Dịka o si kwuo, ""naanị ndị nche na-arụ n'ụlọakwụkwọ karịrị iri asatọ (80)"". Ọzọ bụ na ọtụtụ mmadụ na arụ ebe ahụ ji asambodo na-abụghị ndị ọma ya. Ya kpatara gọọmenti ji hibe kọmitii lebere anya na ọrịa ji ya bụ ụlọakwụkwọ nke mere na ha enweghị ike ikwuli ụgwọ ọnwa ndị ọrụ ha. Agbanyeghị ego mmachi akpa gọọmenti na-enye ha, ụlọakwụkwọ ji ụgwọ toruru ijere naịra abụọ bụ nke Ememanka gwuru na gọọmenti steeti ahụ kwuchapụrụ na 2015. Ya kpatara ya bụ kọmiti ji sị ka a chụọ ndị a niile iji mee ka ya bụ ụlọakwụkwọ kurutu ume ndụ ma kowekwa akpa ya ebe aka ya ruru. Nke a butere ịchụ mmadụ ruru nari abụọ na ụma iri ise na asatọ n'ọrụ. Ememanke kwuru na gọọmenti kwere nkwa ịkwụchapụ ha ụgwọ e ji ha agbanyeghị na-ekwesiri ịtụ ha mkpọro maka asamodo adigboroja ha ji bata." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49632006 +politics "Ndubuisi Godwin Kanu: Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Ndubusi Kanu bụ Gọvanọ mbụ Imo steeti,"" nwụọrọla" "Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buharui atụọla ezipụlara ezinaụlọ ọchịagha mmiri bụ Rear Admiral Ndubuisi Kanu bụ onye nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị Wenezde ka ọ rịchara ahụ ogologo oge. Otu onye dị ya nso achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na Kanu nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị Wenezde n'ụlọọgwụ a kpọghị aha ya na Legọs ka ọ gbachara afọ 77. N'ozi nke onye nnyemaka ya na soshal midia bụ Bashir Ahmad wepụtara n' igwe okwu Twitter, Buhari tiri ezinaụlọ ya, ndị Legos na Imo steeti bụ ebe ọ chịrị aka n'obi maka ọnwụ ya. N'otu aka ahụ onyeisi Ụlọomeiwu Nta bụ Femi Gbajabiamila kwuru na ihe a ga-eji echeta Kanu bụ 'uchu o tinyere n'imepe Legọs steeti na steeti ndị ọzọ ọ chịrị. Gọvanọ Imo steetị bụ Hope Uzodinma, onye kwuru na ya bụ ọnwụ dara ya na mberede sị na Kanu ji obi ya na ike ya niile gbara Naijiria odibo. Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwolu kwuru na ọnwụ ya bụ nnukwu ihe furu Naijiria. Senetọ Shehu Sani kwuru na Kanu bụ ""odogwu nwoke nakwa otu n'ime nna ọchịchị onye kwuuche ya"". Goddy Uwazuruike bụbụ onyeisi otu Aka Ikenga kwuru na ""dịka gọvanọ Imo nakwa Legos, o gosiri ụkpụrụ tọrọ atọ....""Nnukwu mmadụ furu anyị.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-55648514 +health Covid 19 n'otu nkeji: Yabas, jinja maọbụ galik o nwereike inye aka ịgwọta coronavirus? Kedụ ihe ikwesiri ịma maka ịta jinja, galik maọbụ yabas? Ndị mmadụ ga-asị taa jinja, galik maọbụ yabas ka o nwereike inye aka ịgwọta Coronavirus, mana gịnị ka ndị WHO kwuru maks nke a? Ihe onyoonyo a ga-akọwara gị ha niile, kirie ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52100231 +health Covid-19 n'otu nkeji: 'Social Distancing' ga-enye aka ịkwụsị mgbasa coronavirus Ọ bụ eziokwu na gọọmentị Naịjirịa emepeela obodo ka onye ọbụla malite kpagharịwa obere obere, mana ọ dị nnukwu mkpa ka onye ọbụla hie asaa n'anya. Ugbua abụghị oge ibi ọma maọbụ ikwe n'aka, kama ọ bụ oge onye ọbụla ga-anọrọ onwe ya. N'ụlọọrụ nakwa ụlọ ahịa, o kwesịrị ka mmadụ niile buru 'social distancing' n'obi. Cheta na ndụ dị na ntị. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Chukwunaeme Obiejesi https://www.bbc.com/igbo/52547342 +business Aba Footwear Academy: Ana m akuziri ụmụnwaanyị ịrụ akpụkpọ ụkwụ n'izuụka abụọ - Chidimma Chukwuemeka Chidinma Chukwuemeka bụ nwaanyị ihe gbasara ịgba ụmụ nwaanyị ibe ya ume na-anụ ya ọkụ n'obi. Chidinma na di ya Bentley gara mụọ etu e si akụzịrị ịrụ akpụkpo ụkwụ n';ụzọ pụrụiche na mba Italị. Ọtụtụ ụmu nwaanyị bụ ndị gụchara mahadum bịara ịmụta etu esi arụ akpụkpo ụkwụ n'ụlo akwụkwọ ha. Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Vining Ogu https://www.bbc.com/igbo/afirika-57738962 +business Fuel price hike: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnụahịa mmanụ ụgbọala Ndị bi n' Ala Igbo gunyere n' Abia Steeti na-eri arịrị maka mbuli ọnụahịa mmanụ ụgbọala. https://www.bbc.com/igbo/afirika-56395307 +sports Manchester United vs AZ Alkmaar: Ekwensu anya mmeemmee ndị Man utd abịala ha ụgwọ? "Onye ọbụla ga-eche na Manchester United ga-egwe ndị AZ Alkmaar ka ose e ji agwọ abacha. Mana ọ tụrụ ọtụtụ na anya ka agbazụrụ ya bụ egwu bọọlụ, Manchester United gbara aka laa ka afọ ochie. N'agbanyeghị Rashford na ndị agha ha niile, ya bụ Ekwensu anya mmemme bụ 'Red Devils' ndị Man Utd ji abamba, AZ Alkmaar gosiri ha na ha bụ ụkwa a chị n'aka, ọ na-agba. Nke a bụ nke ugboro anọ Manchester United na-agba ọnyụpa. Ole Gunnar Solskjaer bụ onye nkuzi ha na-ebo ya ahịhịa na ala ebe ha gbara ya bụ bọọlụ bụ nke ọ sị na ""anya m ahụnubeghị ụdị nke ahụ mbụ"". Mana onye ga-ekwete ajambele nke a ebe ndị otu ha na-eri ohere niile ha nwere itinye goolu ọkacha nke Jesse Lingard riri n'ikpeazụ. Chi ha zọrọ ha mgbe Myron Boadu nke AZ tinyere otu goolu na agba nke mbụ bụ nke akụchapụru. Ekwensu anya mmeemmee ha anọghị n'ọrụ taa mgbe Stijn Wuytens nke AZ gbatara penariti site na-ịgbatu Marcus Rashford mana anya Referii erughị ya Anya ndị mmụọ bụ ""Video Assistant Referee"" anọkwughị n'ọrụ na asọmpi Yuropa. Ebe chi United nọ gbutọpụ ha bụ mgbe onye otu ha bụ Lingard merụrụ ahụ nke mere na ha jizi mmadụ iri gbachaa ya bụ bọọlụ. Nke a bụ ọrụaka ekwensụ anya mmeemmee ka ọ bụ gịnị? N'aka nke ọzọ mkpọnaala ndị Arsenal dara oke ụda taa ka ha ji ọkpụ anọ asataghị ihe were suchie Standard Liege ntị. Gabriel Martinelli nyere goolu abụọ ebe Joseph Willock na Daniel Ceballos nyere otu otu. Ihe Standard Liege nwere ike ị mere onwe ha bụ ịgbata mpempe akwụkwọ uhie ịdọaka na nti ebe ha na akpọ ganịganị ka ha gbata ihe. Mana Chi ha egbughị ya taa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49927844 +business Okeala Naịjirịa agbapeela, leekwa ngwaahịa iwu ka machiri Dịka ọtụtụ mmadụ na-amali elu maka okeala Naịjirịa na ndị agbataobi ha agbahere, ọ dị mkpa na anyị chetere onwe anyị ngwa ahịa bụ ahịa iwu. Gọọmentị Naịjirịa mechiri okeala ha kemgbe ọnwa Ọgụst afọ 2019 maka ihe ha siri bụ mgba okpuru ndị agbataobi ha na-agba akụnaụba ha. Onyeisi ndị ọrụ kọstọm na Naịjirịa bụ Hameed Ali sị na nke ahụ bụ maka inyere ndị ọrụ ya aka ijikwata okeala Naịjirịa. Ihe ọzọ ha jikwa mechie okeala ndị ahụ bụ maka ịbelata oke ịtụbata nri na ihe ndị ọzọ ana eme na Naịjirịa, iji nyeaka ka ndị nke ana arụpụta na Naịjirịa too. Mana mmechi okeala ndị a butere oke ụbịam na ọnụahịa iri elu karịa uru na ndụ ndị mmadụ. Iji maa atụ, kemgbe otu afọ na ọnwa atọ na ụbọchị iri abụọ na asatọ emechiri ya bụ okeala, ọnọdụ ọtanisi gbasara nrị si na pasentị iri na atọ na ụma iri na asaa (13.17%) mgbe ebidoro ya, ruo pasentị iri na asatọ na ụma iri atọ (18.30%). Dịka atụrụ anya na ọnụ ahịa ụfọdọ nwereike ịgbadata, ọkachasị n'Ekeresimesi a, maka mmepe okeala ndị, ọ dịmkpa ka lee anya na ngwaahịa iwu megbidere maka adịghị ama ama. Dịka Minista Ego, nhazi na Bọọjeti bụ Zainab Ahmed siri kwuo, Onyeisiala Muhammdu Buhari sị na mmachi etinyere n'osikapa, ọkụkọ na nri ndị ọzọ ka dịkwa etu ọ dị. Nke a pụtara na ha ka bụ ahịa iwu. Lekwa ngwahịa dị n'ọbaozi ndị kọstọm iwu machiri Agbanyeghị ọṅụ ụfọdụ na-aṅụ, ụfọdụ na-akọtọkwa ya bụ okeala ndị emepere. Mazị Reno Omokri na-ekwu na ya ahụghị uru ịkpape ya okeala bara ọkacha n'ụdị oge atọchaara ụmụakwụkwọ na Kankara abali ise gara aga. @Mr_Kunlecole nọ na ọnọdụ mgbagwoju anya dịka ọ na-ajụ onwe ya ihe ndị mmadụ chọrọ dịka ụfọdụ na akọtọ ya bụ mmepe bọda ebe ụfọdụ na-akọtọkwa ya. https://www.bbc.com/igbo/media-55345413 +politics Rotimi Amaechi: Buhari bụ nwanne mmadụ maka ịrụrụ Akwammiri Naija nke abụọ "Mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amachi akọwaala ihe kpatara o jiri bụrụ onye kacha mma ịzọ ọkwa onyeisiala Naijiria n'afọ 2022. O kwuru na onye ahụ ga-abụ onye ga-akwalie akụnaụba na onye ga-egbo ọgụ nsogbu ndakpọ nchekwa. Na mkparịtaụka ya na BBC nwere na nsonnso a, Amaechi kwuru na ya bụ naanị onye na-azọ ọkwa onyeisiala bụrụla onyeisi ụlọomeiwu nke steeti, Gọvanọ nakwa Minista. Ọ kwuru na o nweghị onye mụtara ka ihe si aga n'ọchịchị obodo ruo ya n'ime ndị nile na-azọ ọkwa Onyeisiala afọ 2023. O kwuru na ọchịchị ọ chịrị Rivas Steeti ebe e nwere nsogbu nchekwa ndị' militant' butere gosiri na ya nwenwuru ike igbo ọgụ na nsogbu nchekwa na Naijiria dịka onyeisiala. N'okwu mkpagbu ndị Igbo na-ebo Onyeisiala Muhammadu Buhari, Amaechi kọwara Buhari dịka ""nwanne mmadụ"", kwuru na ọchịchị Buhari rụrụ ndị Igbo Akwammiri Naija nke Abụọ, nke ọchịchị Goodluck Jonathan nke ha were ka ọchịchị Igbo arụghịrị ha. Rotimi Amaechi bụ mịnịsta na-ahụ maka njem. Tupu ọ banye n'ọkwa ya ugbua, ọ bụ gọvanọ chịị Rivas steeti. Ọ bụbụ Onyeisi Ụlọomeiwu Rivas steeti Gee ihe o kwuru n'uju:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-61319767 +politics Ndị Ọwụwa Anyanwu kwesịrị iji ọjị na mmanya gaa rịọ nkwado Tinubu maka 2023 - Joe Igbokwe "Onye bụbu ọnụ na-ekwuru patị All Progressive Congress (APC) na Legọs Steeti bu Maazị Joe Igbokwe ekwuola na ndị Ọwụwa Anyanwụ kwesịrị iburu mmanya, were ọjị gakwuru Bola Ahmed Tinubu ma rịọ ya ka o kwado otu onye n'ime ha maka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023. Maazị Igbokwe kwuru nke a na mkparịtaụka BBC Igbo a na-akpọ ""Okwu Akpụ N'Ọnụ"" nke e mere n'ehihie Mọnde. O kwuru na ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị Ọwụwa Anyanwụ ka ọchịchị Naịjirịa ruru na 2023, mana ha kwesịrị iji nwayọ gwakwuru ndị ọnụ na-eru n'okwu na mpaghara dị icheiche ma rịọ ka a kwado ha. Igbokwe gakwara n'ihu kwuo na uche ya na-agwa ya na Tinubu bu n'obi ịzọ oche onyeisiala na 2023, mana ọ bụrụ na ndị Igbo gakwuru ya rịọ ya, o nwere ike ịhapụ ịzọ, ma kwado onye Igbo Dịka Igbokwe si kwuo, ""Tinubu ehiwela akụrụngwa eji achụnta vootu na mpaghara niile na Naịjirịa, ọ bu sọsọ Chukwu nwereike gbanwe obi ya."" ""Jirinu ọjị na mmanya nkwụ ọcha gakwu ya,"" nke a ka Igbokwe kwuru Ọ sị na atụmatụ iji mmanya na ọjị gakwu Tinubu bụ makana ọ bụ odogwu n'ihe banyere ndọrọndọrọ ọchịchi ma bụrụkwa onye ga-abara Ọwụwa Anyanwụ uru n'okwu achụmnta vootu na 2023. ""Ọ bụ Tinubu bu na Buhari meriri n'afọ 2015, nakwa afọ 2019."" Maazi Igbokwe na Ọkaiwu Jimmy Abia - bu onye sokwa na mkparịtaụka ahụ - kwenyere na ndi Ọwụwa Anyanwụ achịbeghị Naịjirịa n'ụdịrị Onyeisiala mbụ. Nke a, dịka ha siri kọwa, bụ maka na agaghị agụnye Nnamdi Azikwe n'ihi na ọ bụghi ya bu onyeisiala n'oge ha, dịka Aguiyi Ironsi bụ onye agha n'oge nke a. Jimmy Abia sị ebe ọbụla e siri lee ya anya, ọ bụ ndi Ọwụwa Anyanwụ ka o ruru. Agbanyeghị nke a, Ọkaiwu Abia sị na ihe a ga na-ekwusi ike bụ na-achọrọ ""Onyeisiala si Ọwụwa Anyanwụ"". Ọ sị na ihe mere nke a jiri di mkpa bụ na ụfọdụ nwereike kuwe Igbo ma chezọọ na ọbụghị sọso n'Ọwụwa Anyanwụ ka Igbo gbara akwara. ""Onye Igbo si 'South South' ekwesighi ịpụta makana Goodluck Jonathan esirila mpaghara ahụ chịa Naịjirịa. E nwere ọtụtụ ndị tozuru ịchị Naịjirịa n'Ọwụwa Anyanwụ Maazị Igbokwe sị na-anaghị achọ onye tozuru ịbụ onyeisiala n'Ọwụwa Anyanwụ. Ọ si na ya ma mmadụ iri tozuru ọfụma ọzọ ọchịchị ma kwuo na ọ dị mkpa ịrụ akwa gaa mpaghara ndị ụzọ. Ihe mere mkparịtaụka jiri dị mkpa Jimmy Abia kwenyere n'ihe Joe Igbokwe kwuru gbasara mkparịtaụka n'etiti ndị Ọwụwa Anyanwụ na ndị mpaghara Naịjirịa ndị ọzọ. Ọ sị na nke a dị mkpa maka na sọsọ vootu si Ọwụwa Anyanwụ agaghị emenwu mmadụ ka ọ bụrụ onyeisiala. Ọkaiwu Abia sị: ""Anyị ga-esetị aka ka anyị na ndị ọzọ kwekọrịta maka atụmatụ a."" Cheta na pati APC kwuburu na ha ga-enye ndị ndịda Naịjirịa ohere ịchị Naịjirịa ma Onyeisiala Buhari rịtuo." https://www.bbc.com/igbo/afirika-55451659 +health Workers' Day: Lee ndị ọrụ nọ n'ihu agha Covid-19 Agha ọbụla biara obodo ọbodo ọbụla nwere ndị nọ n'ihu ya. Ndị dọkịta, ndị nọọsụ, ndị na-emeputa ihe nri , ndị ntakụkọ so n'ụfodụ ndị ọru a. Ọ dịghị fecha fecha mana ha ga na-anwa oke ha. Kedụ ihe ị ga-asị ha? Onye mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo https://www.bbc.com/igbo/media-52450029 +politics Anambra Governorship Election:Ụlọikpe mkpesa maka ntụliaka enyela Andy Ụba na Soludo ohere inyocha akọrọngwa e jiri mee ntuliaka "Ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka mkpesa metụtara nọrọ n'Ọka,isiobodo ụbọchị Tọzde kwenye n'arịrịọ Andy Uba nke APC na Charles Soludo nke APGA rịọrọ ka ha lelee akọrọngwa Inec ji mee ntuliaka gọvanọ n'ọnwa November afọ 2021. Onyeisi ụlọikpe pụrụ iche ahụ bụ Jọstịs D Mohammed sịrị na dịka ya lechara akwụkwọ ha wetara, na ọ dị ya mma, "" Ya mere, ana m enye Inec ntuziaka ka ha nye Uba ohere inyocha akọrọngwa e jiri mee ntuliaka"". O nyere iwu ka e mee nke a n'ihu ndị detara akwụkwọ mkpesa ka emeya, ndị ọ dịị ịsa ha, ndị uweojii na ndị uweojii nzuzo a kpọrọ DSS n'ịchafụ. Uba site n'aka ọkaiwu ya bụ Emeka Okafor na Soludo site n'alka iwu ya bụ Sly Ezeokenwa degara ụlọikpe ahụ akwụkwọ sị ka a manye Inec ka o nye ha ohere inyocha ihe e ji mee ntụliaka gụnyere akwụkwọ mpụtara ntuliaka kpọmkwem. Onye zọrọ ọkwa gọvanọ n'aha pati Accord bụ Godwin Maduka tinyeburu otu akwụkwọ ahụ site n'aka ọkaiwu ya bụ N. Agụ mana o mechara bịa wepụ ya, sị na ya achọghịzi. Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja akachapụla akwụkwọ mmadụ abụọ gbara Charles Soludo maka nhọpụta ya dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra Steeti. N'ikpe ọkaikpe Taiwo Taiwo kpere, akwụkwọ sị ka a kagbuo mmeri Soludo maka ebubo na ọ tụrụ asị n'ozi o nyere ụlọọrụ Inec mgbe ọ na-edebanye aha n'akwụkwọ ịzọ ọkwa. Ndị gbara akwụkwọ bụ Adindu Valentine na Egwudike Chukwuebuka bụ ụlọikpe sị na akwụkwọ ha achịtaghị aja ọbụla. Ọkaikpe Taiwo gara n'ihu gwara mmadụ abụọ ahụ kwụọ APGA, Soludo na osote ya bụ Ibezim ego dị nde naịra abụọ. Otu onye enyemaka Soludo bụ Ejimofor Opara gwara BBC Igbo na obi dị ha ụtọ maka ikpe ahụ ma sị na ha nabatara ya nke ọma. Mmadụ abụọ agbaala Soludo akwụkwọ n'ụlọikpe gbasara ntuliaka Anambra Dịka ọkammụta Chukwuma Soludo na-enwe aṅụrị maka imeri ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti, mmadụ abụọ ọzọ agbaala ya akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja. Dịka ụlọ ntaakụkọ Punch si dee, aha mmadụ abụọ a bụ Adindu Valentine na Egwudike Chukwuebuka. Ha na-ebo ebubo na Soludo na ndị pati ya bụ APGA, tụụrụ INEC asị n'akwụkwọ ha binyere aka na ya tupu ntuliaka ahụ. Adindu na Egwudike na-ekwu na Soludo nakwa onye osote ya bụ Onyeka Ibezim, dere na ọ bụ ọkwa ""Aguata 2 Constituency"" ka ha na-azọ, kama ide na ọ bụ ọkwa ""Gọvanọ"". Ha na-akọwa na asị ahụ Soludo tụụrụ ndị INEC megidere iwu, nke pụtara na ụlọikpe kwesịrị ịkụchapụ aha Soludo maka ya bụ ntuliaka. Mana ọkaiwu Soludo nakwa nke APGA bụ Onyechi Ikpeazu kọwara na ya bụ okwu erijughị afọ, ma kpọọ ụlọikpe oku ka ha tụzụga ya n'akụkụ. Ikpeazu kọwara na ndehie ihe n'akwụkwọ 'affidavit' erughị ihe a ga-eji kụchapụ aha mmadụ n'ịzọ ọkwa ọchịchị. Ọ kọwara na mmadụ ịtụ asị, dịka o si dị n'akwụkwọ iwu ntuliaka, bụ mgbe mmadụ chọrọ igosi na ọ bụ ihe ọbụghị maọbụ na o nwere ihe o nweghị n'eziokwu. N'aka nke ọzọ, ọkaiwu INEC kwuru na ha agaghị etinye ọnụ na ya bụ okwu, kama ka ụlọikpe kpebie ya etu ka ya mma. Ọkaikpe Taiwo Taiwo etinyela ya bụ ikpe ka ọ dị n'abalị iri atọ nke ọnwa Nọvemba a. Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa ekpebiela ikpe gbasara onye kwesịrị ịnọchite anya pati 'All Progressive Grand Alliance' (APGA) na ntụliaka ọkwa Gọvanọ Anambra steeti. Ha kwuru na ọ bụ Chukwuma Soludo bụ onye tozuru ịnọchịte anya APGA. Mkpebi a bịara n'ụbọchị Tọzde n'ụlọikpe 'Supreme Court' n'Abuja. Cheta na otu APGA keburu ụzọ abụọ dịka mmadụ abụọ na-azọ onye bụ onyeisioche pati ahụ. Mmadụ abụọ a bụ Jude Okeke na Victor Ike Oye haziri ntuliaka imeụlọ nke ha n'iche n'iche ma wepụtakwa onye nke ha. N'otu nke Jude Okeke, ha wepụtara Chukwuma Umeoji, ebe otu nke Victor Oye wepụtara Chukwuma Soludo. Ngalaba nhazi ntuliaka bụ INEC bu ụzọ kwuo na ọ bụ Chukwuma Umeoji ka ha ma, nke mere ka ya bụ okwu pụọ ụlọikpe. Ụlọikpe mkpegharị mechara gwa INEC ka ha wepụ aha Umeoji tinye Soludo, mana Umeoji na Jude Okeke wepụrụ okwu ahụ n'ụlọikpe kachasị. Ọ bụ mkpebi a ka ụlọikpe kachasị nyere taa n'Abuja. Charles Chukwuma Soludo agwala BBC Igbo na obi dị ya sọ aṅụlị, maka etu Inec si debanye aha ya n'ime ndị ga-eso zọọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti. Ọ gara n'ihu gwa BBC Igbo si na ""Ọ ga-eme eme!"" Taata bụ ụbọchị 19 Ọgọst , 2021 ka ụlọrọrụ Inec bụ Independent National Electoral Commision jiri debanye aha Maazị Soludo site n'ibipụta ozi ọha a: Inec sị na ha debanyere aha Charles Soludo dịka o nwere mmeri n'ụlọikpe mkpegharị dị na Kano. Nke a bụ akụkọ na-apụta ugbua site n'akara Facebook ndị Inec bụ ndị na-achịkọta ntuliaka na Naịjirịa, lee aha Soludo n'ahịrị 6 n'akwụkwọ ha: Lee aha ọhụrụ ndị Inec wepụtara ka ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ taata bụ ụbọchị 19 ọnwa Ọgọst, 2021. Nke a pụtara na Inec ewepụla aha Chukwuma Michael Umeoji, ebe osote ya bụ Orogbu Obiageli Lilian. Ọ bụ aha ndị ka ha tinyeburu site n'ikpe ụlọikpe dị na Jigawa. N'akwụkwọ a nke BBC Igbo hụrụ anya, aha Ifeanyi Ubah nke na-azọ n'okpuru otu YPP adịghị ya. Kama aha onye na-azọ ọkwa dịka osote ya bụ Okechukwu Nnamdi Eze bụ ihe edepụtara. Ntụliaka ọkwa Gọvanọ Anambra steeti bụ nke ga-eme n'ọnwa Nọvemba afọ 2021 dịka ụlọọrụ Inec si kwuo." https://www.bbc.com/igbo/58274426 +health Skin Bleaching: Ihe nde kwuru nde ụmụnwaanyị na-ete ude ịcha ọcha na-agabiga "Shiroma Pereira (Nke a abụghi ezi aha ya) ji akwa sị; ""A jọrọ m ezigbote njọ oge agbamnkwu m. Ajọbeghị m ụdị njọ ahụ mbụ. O bi nso n'isi obodo Sri Lanka bụ Colombo. Dịka ọtụtụ mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ Asia, o kpebiri ime ka akpụkpọ ahụ ha chaa ọcha tupu oge agbamakwụkwọ ya eruo. Olileanya ya bụ na ọ ga-enwe akpụkpọ ahụ mara mma. ""Dịka ọ fọrọ ọnwa abụọ tupu agbamakwụkwọ m, agara m ụlọ ndozi isi, ha were nyem ude ọcha"" Ọ gwara BBC sị, ""Mgbe m techara ya n'otu izu, ihu m agbanwee na-acha ọcha."" ""Achọrọ m inwe ahụ ọcha mana ọ bịara gbaa m ọkụ."" Kama ọ ga-agbado anya n'ịkwado agbamakwụkwọ ya, nwaanyị ahụ mefuru ego ya na oge ya n'ọgwụgwọ. ""E nwere m ọkọ dị ọcha wụrụ m n'ahụ nke mechara chọrọ apa ojii"" Ude ọcha enyere ya tee bụ nke ezighi ezi. E zobatara ya ma zụọ ya n'ahịa iwu. Apa na-eji oji ka na-egosi n'ahụ Pereira dịka otu afọ ebe ọ na-agwọ ya gafechara. Ya mere na gọọmentị mba Sri Lanka amalitela ịmachi orure ude ọcha. Mmadụ nde ole na ole ọkachasị ụmụnwaanyị n'Afrịka na Eshia na-eme ihe niile ruru ha aka ịcha ọcha. Ahịa ude ọcha ruru ihe karịrị ijeri dọlla 4.8 n'afọ 2017 ebe a na-atụ anya na ọ ga-eru ijeri dọlla 8.9 n'afọ 2027. Ọ gụnyere ncha, ude, na ọgwụ ntụtụ ga-ebelata ahụ mmadụ nrụpụta kemikal melanin nke na-ewu ewu. Dịka World Health Organization (WHO) ụmụnwaanyị anọ n'ime iri na-ete ude ọcha n'Afrịka. N'Afrịka, Naịjirịa nọ n'ọkwa mbụ ebe ụmụnwaanyị 77% ma-ete ya bụ ude. Togo 59% na Sawụt Afrịka 35% so ha na-azụ. N'Eshia, ụmụnwaanyị 61% n'India nakwa 40% na Chaịna na-ete ya. N'afọ gara aga, gọọmentị Ghana dọrọ ụmụnwaanyị dị ime aka na ntị ha kwụsị ịṅụ ọgwụ ga-eme ka nwa ha bu n'afọ chaa ọcha bu gluthatione n'ime ya. Ụmụnwaanyị na-aṅụ ọgwụ ahụ na-eche na ọ ga-eme kia nwa ha bu n'afọ chaa ọcha. Melanin bụ agwa ojii dị n'ime ahụ na-eme ka mmadụ dịrị oji. Ngalaba ehibere maka akpụkpọ ahụ nke mba Briten tinyere ọnụ n'okwu gbasara ude ọcha. Ha kwuru na ""hydroquinone nwereike ịgwọ agwa ezighi ezi maọbụrụ na dọkịta akpụkpọ ahụ mara maka ya ma tinye ya anya"" Ha kwukwara na ụfọdụ ihe na-ahake mmadụ nwekwara ejiji dị mma n'ọgwụgwọ. Ọ na-arụ ọrụ? Mana ngalaba ahụ kwuru na ""o nweghi ụzọ ziri ezi a ma ama mmadụ ga-eji chake akpụkpọ ahụ ya."" Ha kwukwara na ụfọdụ dọkịta na-enye ndị mmadụ ude nchake ịji gwọ ọrịa dịka melasma. Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-ego ude ọcha n'ajụghị ajụ mana o nwereike ịmebi ụfọdụ ihe na-ahụ dịka: (Onye kwuru - NHS UK) Ụfọdụ ngwa ọcha a na-enwekwa ihe na-emerụ ahụ n'ime ya. ""Ngwa ọcha ọbụla nwere Mekuri n'ime ya adịghị mma na-ahụ"" ka WHO kwuru Mana ha chọpụtakwara na a ka na-emepụta ngwa nwere ya bụ kemikal na Chaịna,Lebanon, Pakịstan, Amerịka na Tailand. ""Mekuri bụ nsị"" ka Alexandroff kwuru Ihe ndị dị mkpa ọ na-emebi n'ime ahụ gụnyere:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48910520 +business "Ọgba Mbọ: ""Ego dị n'ịzụ ọkụkọ Bekee""" Dịka gọọmenti etiti na-egosi mmasị n'ọrụugbo, ọtụtụ mmadụ amalitela itinye isi na ya n'ụzọ dị iche iche. BBC Igbo mere ihe ngosi a ga-enyere ndị mmadụ aka ịchọpụta mpio na ntubirikọ dị na ya bụ ọrụ. Ochie dika n'ịzụ ụmụanụ bụ Ephraim Chukwu gwara BBC Igbo na ya bụ ọrụ nwere nnukwu uru mana ọ dịghị mfe. Lee ihe okwuru n'ihe nkiri a dị n'elu. Onye mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke na Nnamdi Agbanelo Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50225826 +entertainment Pretty Mike: Ihe mere m jiri buru ụmụnwaanyị di ime ga n'agbamakwụkwọ Williams Uchemba "Na mkparịtaụka Pretty Mike na BBC Igbo, Pretty Mike sị na o bu ihe ọma n'obi wee buru ụmụnwaanyị ndị ahụ di ime ga n'agbamakwụkwọ Williams Uchemba. Ọ sị na o mere ya ka o nye ụmụnwaanyị ndị ahụ obi ụtọ. Pretty Mike kwukwara ọtụtụ ihe maka ndụ ya na mkparịtaụka a. Pretty Mike kpọrọ ụmụnwaanyị isii dị ime bia agbamakwụkọ Williams Uchemba na Brunella Oscar were isi na ha bu nwa ya n'otu n'otu. Ka Pretty Mike na ụmụnwaanyị isii di ime wuchiri, ndị mmadụ wee na-elegharị anya. Mana o bighi ebe ahụ, ha gara n'ọtụtụ igwe soshial midia, kpụrụ ya n'ọnụ, mere ka o wee wukarịa ndị gbara akwụkwọ. Onye na-eme ihe nkiri nakwa akpa ọchị a ma ama bụ Uchemba Williams echizuola n'iza di Brunella Oscar. Ha gbara akwụkwọ nke ụka ụnyaahụ bụ Nọvemba 21, afọ 2020 na Lagos n'isi ụlọụka Dominion City dị na Leeki Phase 1. Uchemba na nwunye ya mere agbara nkwụ ha n'izuụka gara aga. Brunella Oscar bụzị oriaku ọkpaọchị a ma ama aha ya bụ Williams Uchemba. Foto ebe ha gbara akwụkwọ omenaala wuru ewu ọfụma na soshal midia na ngwụcha izu ụka a n'Alor dị n'Anambra steeti. Nke a mere dịka Uchemba wepụtachara foto ya na Brunella Oscar sere n'elu soshal midia n'oge gara aga wey na-ekwu na oge eruola o ga-eji lụọ nwaanyị. Uchemba mechara kwuo na agbamaakwụkwọ nke ụka ha ga-eme n'ụbọchị Novemba 21,2020. Ụlọọrụ Naịja Digest mgbasaozi depụtara na Nwolisa kwuru na ọ hụrụ onyonyo Uchemba na Facebook ma zigara ya ozi n'ọba ozi n'afọ 2016 ya makana ọ nụrụ n'uche ya na ọ hụla di ya. N'akụkọ ahụ o kwuru na mgbe ọ gwara ndị ọyị ya na ọ hụla di ya na ha che na ọ na-ayị ara. Brunella kwuru na Uchemba sara ozi ya ma jụọ ebe o si, o mechara gwa ya na o si n'ebe nne na nna ya bụ Nwolisa agaghị ekwe ka ọlụọ nwa ya. Onye bụ di ya bụ Wiliams Uche Mba? Williams Uche Mba bụ otu n'ime ndị na-eme ihe ejije ama ama na Naijirịa. Mba bidoro na soshal Midịa dịka onye na-akpa ọchị ma mechaa banye n'iti egwu nwa mgbe nta E ji ""I dont like what i hate"" were mara dịka onye na-akpa ọchị. Mba bidoro ""Project One mIllion"" nke ga-enyere ndị mmadu aka ịgụ akwụkwọ, ịmụta aka ọrụ ma ị hụ kwa na ndị mmadụ nwere ebe obibi. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-54949334 +entertainment Lion Heart: Ejije Genevieve Nnaji wepụtara nwere ike ituru ugo 'Oscar' "Ihe ejije nke nwaada Igbo bụ Genevieve Nnaji mepụtara aha ya bụ 'Lion Heart' nwere ike ituru ugo 'Oscar'. Otu a kpọrọ 'Nigerian Oscars Selection Committee' (NOSC) bụ ndị họpụtara ejije a ka o soro na ndị a ga-atule maka nturuugo 'Oscar'. Ụmụnwaanyị Imo state bụ ""a kwaa a kwụrụ"" na Nigeria Ugboro atọ mgbọ egbe 'stray bullet' tụrụ ndị Nollywood 'Lion Heart' bụ ejije maka onye ọgaranya nwere ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọala. Mgbe ụlọọrụ ahụ chọrọ imechi n'ihi ụgwọ ha ji otu ụlọakụ, ada ọgaranya ahụ gbalịrị ike ya iji hụ na-emechighi ya. Otu n'ime ihe mmụta dị n'ejije a bụ na nwanyị bụ ihe. Ndị a ma ama dịka Genevieve Nnaji, Pete Edochie, Nkem Owoh, Kanayo Kanayo na oti egwu Phyno socha mee ya bụ ejije. Onyeisiala Muhammadu Buhari ahapụla Naịjiria taa bụ Wenezde gawa Saụt Afrịka. Njem a bụ ka ya na onyeisiala mba ahụ bụ Cyril Ramaphosa tinye ọnụ n'okwu gbasara 'Xenophobia'. Ndị so Buhari mee nje m gunyere gọvanọ Kano steeti, Umaru Ganduje, Dave Umahi nke Ebonyi nakwa Simon Lalong nke Plateau. Cheta na ndịisiala abụọ ahụ bu ụzọ zigara onwe ndị ozi gbasara ya bụ okwu. A na-atụ anya na nzute Buhari na Ramaphosa ga-eweta okwu ịkpa oke agbụrụ n'isi njedebe maka na o si taa dịwa mma ọ dịwara gboo. Tambuwal na Ganduje enwetala mmeri Ụlọikpe ntuliaka na Kano Steeti eweliela gọvanọ Umar Ganduje aka elu. Ha kwuru na ọbụ Ganduje tuuru ugo n'ezie na ntuliaka oche gọvanọ e mere n'ọnwa Mach afọ a. N'otu aka ahụ, ụlọikpe ntuliaka nke Sokoto steeti kpebikwara na ọbụ Aminu Tambuwal meriri ntuliaka gọvanọ steeti ahụ taa. Ikpe ahụ dị n'etiti gọvanọ Aminu Tambuwal nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' na Ahmed Aliyu nke otu 'All Progressives Congress'. Mba Amerịka amachiela ntụbata ọla dayamọnd site n'obodo Zimbabwe. Iwe ha bụ na Zimbabwe na-amanye ndị mmadụ amanye ịrụ ọrụ n'ebe a na-egwuputa 'diamond' ndị ahụ. Mana ndị ọchịchị Zimbabwe kwuru na Amerịka asigbuola onwe ha n'asị, maka na onweghị onye ha manyere ka ọ rụọ ọrụ ebe ahụ. Jamal Khashoggi Taa ka o mere otu afọ e ji gbuo Jamal Khashoggi onye ntaakụkọ si mba Saudi Arebia. N'ụbọchị Wenezdee, ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ n'ihu ụlọ embasi ndị Saụdi Arebia nke dị na mba Tọkị. Ọ bụ n'ime embasi ahụ ka a nọ gbuo Khashoggi n'afọ gara aga. Hatice Cengiz, onye Khashoggi chọbụrụ ịlụ, na-akpọ oku ka ejide ndị gburu ya ma maa ha ikpe. A na-ebo ọkparaeze ndị Saudi Arebia bụ Mohammed bin Salman ebubo na aka ya dị n'ọnwụ Khashoggi. Mana ọ gọrọla ọnụ ya na aka ya adịghị ya. Asọmpi UEFA Champions League ka na-agakwa n'ihu. Otu egwu bọọlụ Liverpool, Chelsea, Barcelona, Inter Milan na ndị ọzọ ga-apịrị ya n'abalị taa N'asọmpị nke ụnyaahụ, Bayern Munich ji goolu asaa asatara abụọ saa Tottenham ahụ. Manchester City meriri Dinamo Zagreb 2-0, Real Madrid na Club Brugge gbara onwe ha 2-2. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49909196 +politics Ondo State election results 2020: Rotimi Akeredolu emeriela ntuliaka gọvanọ maka afọ anọ ọzọ Gọvanọ Ondo steeti bụ Rotimi Akeredolu emeriela ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na Ondo steeti n'ụbọchị Satọde. Nke a pụtara na ọ ga-achịkwa Ondo steeti afọ anọ ọzọ ruo afọ 2024. Rotimi Akeredolu meriri n'okpuru ọchịchị iri na isii n'ime okpuru ọchịchị iri na asatọ dị na Ondo steeti. Lee maapụ na-egosi mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Ondo steeti. Pia aka na maapụ gosiri okpuruọchịchị 18 dị na steeti ahụ ka ị hụ paati na-emerinu ugbua nakwa etu ndị mmadụ si tụ vootu. Nsịrịpụta; INEC Igodo maapụ Anya anyị na-ahụ mpụtara dịka a na-akpọpụta ya ma na-edepụta ya ozugbo a na--akpọpụta ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-54485427 +health Coronavirus: Gịnị mere ọnụọgụgụ ndị nwere ọrịa a na Naịjirịa ji arị elu? "Pịa ebe a ka ị hụ ebe coronavirus kachasị emetụta ndị mmadụ n'ụwa. Ọtụtụ mmadụ na soshal midia na-ada ebube etu ọnụọgụgụ ndị bu nje coronavirus jiri rie elu ruo dịka ndị a chọpụtara nwere ọrịa a ruru 1552, nke gụnyere mmadụ 195 a chọpụtara n'abalị Tuzde. Ngalaba na-egbochi ọrịa Bekee kpọrọ ""Nigerian Centre for Disease Control"" (NCDC) bụ ndị wepụtara ọnụ ọgụgu ọhụrụ a n'akara Twitter. NCDC na-enye akara mmadụ ole gbakerela na mmadụ ole nwụrụla. Nke a na-abịa ka Naịjirịa nọ ihe karịrị otu ọnwa na mmachi ngagharị nke bidoro n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Maachị. Dịka onyeisiala Buhari siri kwuo n'oge ọ manyere mmachi ngaghari a, ọ bụ iji belata mbanwanye nje coronavirus ma hazie etu a ga-esi buso ya agha ọfụma mere o jiri wepụta atumatụ ahụ. Nke a mere ụfọdụ mmadụ, dịka onye ji akara @_oluwatobiiii, ji ajụ ihe mere eji ekwu okwu mmepe na-agbanyeghi na nje coronavirus na-abanwanye. Ma sị na ya achọghị atumatu ahu ọzọ. Onye ọzọ ji akara @zizoholic ede sị na etu ihe siri kwụrụ ugbua mere ka ya na-ajụ ọrụ mmachị ngagharị rụrụ. @MaraAzuh sokwa tie mkpu maka ọnụ ọgụgụ ọhụrụ a. Ọtụtụ ihe kpatara ọnụọgụgu a ji na-abanwanye mana nke kachasị nke bụ ihe Bekee kpọrọ ""community transmission"". Ọzọ bụ mwulite nnyocha ndị mmadụ. Lee nkọwa atụmatụ abụọ: 1) 'Community transmission"" Community transmission, bụ nke Igbo na-akpọ ""mfesa n'ime obodo"", pụtara mgbe ndị mmadụ bi n'otu ebe malitere ịbunye onwe ha ọrịa ọbụla n'abụghị nke ha butere n'aka ndị si njem bịa n'obodo ahụ. Onye mbụ a hụrụ ọrịa Coronavirus n'ahụ ya na Naịjirịa bụ otu nwoke onye Italy bịara njem na Naịjirịa mana ugbua, ọrịa ahụ ebidola mfesa n'ime obodo. Na Legọs ebe ọnụọgụgụ kachasị maọbụ ""epicentre"" na Bekee, Gọvanọ steeti ahụ bụ Babajide Sanwoolu kwuru na ọ bụ n'ọnọdụ ahụ ka steeti ya nọ. Nke a pụtara na ọ dịzi mfe mmadụ ịbunye ya ibe ya nke mere na ọtụtụ mba ka machiri ọgbakọ ọha mmadụ nakwa ịmanye iwu akwa mkpuchi ihu iji belata ya bụ mfesa. 2) Mwulite ihe niile gbasara nyocha Kemgbe onye mbụ butere ọrịa ahụ, ngalaba NCDC na-agbasi mbọ ike ịwulite nnyocha ndị mmadụ. Dịka ha si kwuo n'akara Twitter ha ""nnyocha bụ isi mbido mbelata mfesa ọrịa a"" Ugbua, enweela ụlọ nnyocha iri na asaa ma na-akwado kwa ịtinye ọzọ. Ụlọ nnyocha ndị a ebidola iji usoro ""COBAS"" ga-eme ka e nwee ike inyocha mmadụ narị itoolu na iri isii n'ime elekere asatọ Ihe ndị niile na arụtụ aka na onụọgụgụ ka nwere ike ịgbalite dịka a na-achọpụta ndi mmadu ọhụrụ. Na Amerịka, bụ be ndị bu nje a ruru otu nde ụnyaahụ, Onyeisiala Donald Trump sị na ọ bụ maka nnyocha ha na-emesi ike mere e ji achọpụta ndị mmadụ n'ike n'ike. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwukwa na ime nnyocha n'igwe ga-enye aka imata etu ọnọdụ mba ọbụla si kwụrụ n'okwu coronavirus a." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52472920 +entertainment Jim Iyke ọ banyela okpukperechi Alakụba? – Lee nke bụ eziokwu Akụkọ na-efegharị na soshal midia ugbua bụ na onye ejije Nollywood a ma ama bụ Jim Iyke abụrụla onye okpukperechi Alakụba. Nke a na-abịa dịka foto so akụkọ a gosiri ebe Jim Iyke yi ejiji dị ka nke ndị okpukperechi Alakụba ma jiri ọla ekpere ha bụ ‘Tasbih’ n’aka. Ọtụtụ ndị na-ekesa akụkọ a na soshal midia na-ekwu na ọ bụ onyeisi ndị ụka Alakụba n'Imo steeti bụ Sulaiman Yusuf Njoku bụ onye gbara ama akụkọ a. Ha sịkwara na ọ bụ ya dubanyere ya n'ụzọ ite mmanụ n'isi nke mbụ n’okpukperechi ahụ. Njoku bụ onyeisi okpukperechi a n'Imo Steetị gwara BBC Igbo na akụkọ a abụghị eziokwu. O kwuru: “Nke bụ eziokwu bụ na Jim Iyke bịara hụụ anyị na ngwụcha ọnwa Mee afọ 2022” “E nwere onye ezinaụlọ anyị nwụrụ nke ọ bịara njem nleta ịhụ anyị” “Akụkọ a nke ndị mmadụ na-akpọ aha m na ya abụghị eziokwu dịka o teela Jim Iyke na-ekesa foto a, nke a bụ tupu ọ bịa ya bụ njem nleta” Kedụ ihe Jim Iyke kwuru? I ji saa akụkọ a, Jim Iyke zipụtara ihe onyonyo ọhụrụ n’akara Instagram ya ma kwuo na o nweghi mgbe o ji wụbanye n’okpukperechi Alakụba. Iyke kwuru “E nwere ihe a naghị eji egwu egwu” “E mere ejije n’ọnwa gara aga na mba Ghana nke ga-apụta na nso nso a” “Ejije ahụ bụ maka ndi Alakụba ọ bụ mgbe ahụ ka e sere foto a, ọ bụ etu a ka ndị akụkọ ụgha siri malite ikesa akụkọ a” “Ana m akwenyere okpukperechi niile ugwu mana enweghị m atụmatụ ọbụla ibanye ofufe Alakụba” Ụfọdụ na soshal midia na-ekwu na Jim Iyke ji aka ya ekesa akụkọ a n’ụzọ agụghọ iji ree ahịa ejije ọhụrụ ya. Ndị kwuru nke a na-arụ aka n’ihe Jim Iyke na Uche Maduagwu mere n’oge gara aga mgbe ha tụrụ asị n’okwu Jim Iyke iti ya ihe. Akụkọ a wuru ewu ebe Jim Iyke gwara BBC Igbo n’oge ahụ na ya bụ akụkụ iti ihe bụ eziokwu. Dịka ọnwa ole na ole garachara, Jim Iyke pụtara kọwaa na ya bụ akụkọ bụ ụgha. O kwuru na ya na Maduagwu kpara ya akpa ka e sete ha abụọ ebe ọ dị ka ọ na-eti ya ihe iji ree ahịa ejije ọhụrụ. Ejije a bụ maka ndị na-akatọ ndị mmadụ na soshal midia nakwa etu ha nwereike isi dabanye na nsogbu. Dịka Naịjirịa dị, e nwere okpukperechi atọ kacha ewu ewu, abụọ n’ime bụ nke ọkankụ ndị Naịjirịa na-esonye – Okpukperechi Kraịsti na okpukperechi Alakụba. Nke atọ bụ okpukperechi nke omenala. Ndị nọ na ndịda Naịjirịa na-aka esonye okpukperechi Kraịsti ebe ndị nọ n’ugwu Naịjriịa na-aka esonye okpukperechi alakụba. Jim Iyke dịka onye si Anambra steeti nke ọwụwa anyanwụ Naịjirịa egosila ugboro ugboro na ọ bụ onye okpukperechi Kraịstị nke otu n’ime aka ebe gosiri nke a bụ ihe onyonyo pụtara ihe mgbe ọ gara ụka Kraịsti a ma ama bụ ụka Synagogue nke TB Joshua larala mmụọ nọ n’isi ya gaa nata ekpere. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ ihe ịtụ n’anya ma ahụ onye ndịda Naịjirịa isonye okpukperechi alakụba ebe ọ na-abụkwa ihe ịtụ n’anya ma ahụ onye mpaghara ugwu Naịjirịa sonye okpukperechi Kraịsti. Nke mere akụkọ okpukperechi Jim Iyke ji sara ọkụ ọkachasị dịka ọ bụ onye a ma ama. https://www.bbc.com/igbo/articles/c88qxqz3g9go +business Imo State Pension: Gọọmentị akwụchabeghi anyị ụgwọ ezumike nka - Onyeisioche ndị 'pensioners' "Ụfọdụ ndị ọrụ lara ezumike nka n'Imo Steetị ekwuola na ọ bụghị eziokwu na gọọmentị akwụchaala ha ụgwọ ezumike nke ruo ọnwa Disemba. N'ozi Kọmishọna mgbasaozi n'Imo Steetị bụ Declan Emelumba wepụtara mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Owere, ọ sịrị na Gọvanọ Hope Uzodinma akwụchaala ndị ọrụ nakwa ndị lara ezumike e nyocharala ụgwọọnwa rute ọnwa Disemba, afọ 2020. Emelumba sị na ozi banyere etu ha si kwụọ ụgwọ dị na websaịt ha a. Mana onyeisi kọmitii na-agba mbọ maka ụgwọ ezumike nka (Pensioners Intervention Committee) n'Imo Steetị bụ Ikechukwu Ohaneje sị na okwu a bụ asị ọcha. Ọ sị na kemgbe Gọvanọ Hope Uzodinma baara n'ọchịchị n'ọnwa Jenụwarị afọ 2020, na ọ bụ naanị ụgwọ ezumike nke ọnwa Jenụwarị na Febụwarị ka ọ kwụzuru ndị mmadụ. ""Kemgbe ahụ o naghị akwụzu ụgwọ ezumike nka, o nwere ndị ọ kwụrụla ọnwa asatọ, ọnwa anọ, otu ọnwa. Ohaneje kwuru, ""E nwekwara ndị a kwụrụ ụgwọ ọnwa Nọvemba na Disemba afọ 2020 ma mechaa mịrị ego otu ọnwa n'ọbaego ha"". Ohaneje sị na nnyocha gọọmentị sị na ọ na-eme bụ nke gọvanọ ji aka ya eme na o nweghi mgbe a gwara ndị lara ezumike nka bịa ka e nyochaa ha. Na gọọmentị na-eme nyocha n'ime ọbi ọchịchị gọvanọ, ebe otu jikọtara ndị lara ezumike nka na-amaghị maka ya. Ọ gara n'ihu sị na ha emeela nnyocha dịka ha na-ala ezumike nka n'ọrụ tupu e nye ha akwụkwọ njirimara ha dịka ndị lara ezumike nka. Ọ sị na mgbe Emeka Ihedioha nọ n'ọchịchị na o kwuru na a ga-eme nnyocha nke onye ọbụla gara n'ụlọọrụ ya dị iche iche e nyochaa ha. Onyeisi ndị ndị lara ezumike ike nka n'Imo steeti bụ Ikechukwu Ohaneje ekwuola na ihe mere na osoghi mee ngagharịiwe ndị otu ya mere n'ụbọchị Tuzde bụ maka na ndị ọrụ nchekwa nke nke 'State Security Service' majara ya. Ohaneje gwara BBCIgbo na ndị ọrụ nchekwa a biakwutere ya n'ụbọchị Mọnde gwa ya na ha hụ ya ebe a na-eme ngagharịiwe na ha ga-ata ya ahụhụ. O kwuru na ndị DSS a gwara ya na ọ bụrụ na ya abịaghị na ndị otu ya agaghị eme ngagharịiwe ọbụla. Ohaneje kwuru na ndị otu ya si na ha ga-eme ngagharịiwe n'ihi na agụrụ na-agụ ha n'ihi na anaghị akwụ ha ụgwọ ọnwa. Ọ kọwara na ọ bụ onye nkwuchite ọnụ ha kama na ndị otu ya sị na ha ga-eme ngagharị iwe, na o nweghị ike ịkwụsị ha. Ọ kọwara na ọ gbara ọsọ n'owerre n'ụbọchị ahụ. Ohaneje kwuru sị ""Ọ bụ ihe nwute na gọọmentị Imo steeti sitere ndị bịara pia ha ihe ma wụọ ndị okenye mmiri"". O kwuru na ọ bụ mgbe ọ kpọrọ ha n'ekwe ntị ka ha gwara ya na ndị agboro tiri ha ihe. Ohaneje kwuru na mgbe ndị otu ya ahụghị ya, ha mere ngagharịiwe were sị ka akpọpụta Ohaneje. O kọwara na ọ bụ osote onyeisi ndị uwe ojii biakwutere ha, were kwa ha na Ohaneje anọghị n'aka ha. Ohaneje kwuru sị "" Anyị na-ajụ si na olee ndị kpọtara ndị a bịara pịa ndị okenye ihe n'ihi na ha chọrọ ihe ruru ha. Onye na-ahụ maka mgbasa ozi nke gọọmentị Imo steeti bụ Oguiwike Nwachukwu gwara BBCIgbo na ọ bụ asị. O kwuru na enweghị ihe dị otu ahụ mere. O kwuru sị ""Ọ bụ ndị ezumikenka ibe ha chụrụ ha ọsọ"". O kwuru na ha na-eme ngagharị iwe mbụ ma enweghị onye nyere ha nsogbu na gịnị ga-eme ka gọọmentị bido ịnye ha nsogbu ugbu a." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53670370 +politics Miyetti Allah South-East: O nweghi ebe anyị na-aga n'ihi na Ndigbo anaghị enye anyị nsogbu "Otu Miyetti Allah bụ otu jịkọrọ ndị ọchịehi ngalaba nke Ọwụwa-Anyanwụ Naijria ekwuola na ha adịghị njikere ịza oku ndị siri ha lọghachi Ugwu. Ha kwuru na o nweghị onye na-enye ha nsogbu n'Ọwụwa-anyanwụ ga-eme ha hapụ ebe ahụ lọghachiwa Ugwu-Awụsa. Na mkparịtaụka onyeisi otu Miyetti Allah n'Ọwụwa-Anyanwụ bụ Alhaji Sidikki Gidado na BBC nwere n'ekwentị, o kwuru na ha adịghị nkwadobe ịga ebe ọbụla. ""Anyị agaghị aza oku ahụ n'ihi na anyị na ndị Ọwụwa-Anyanwụ enweghị nsogbu. Anyị bi n'udo."" ""Ndị ọchịchị steeti dị icheiche hibere otu na-eleba anya na nsogbu ọbụla dapụtara n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo."" Ọ gara n'ihu katọọ oku ahụ ndị okenye Ugwu akpọrọ 'Northern Elders Forum' nakwa ndị 'Coalition of Northern Groups kpọrọ, sị na ha na-awụnyere ha aja na garị. ""Ụdị oku ahụ ga-ebutere anyị nsogbu."" Siddiki dụrụ ọdụ ka ndị Ugwu na nke ndị ndu Ọwụwa-anyanwụ gbakọta ọnụ nwee mkparịtaụka ma e nwe nsogbu kama ị na-akpọ ụdị oku a. Gee ihe o kwuru n'olu Bekee: Cheta na abalị ole na ole gara aga, otu jikọrọ ndị okenye na ndị ntorobia ndị Ugwu a kpọrọ ụbọchị Tuzde ka ndị Fulani ọchịehi niile nọ n'Ọdịda Naijiria lọghachi Ugwu Awụsa." https://www.bbc.com/igbo/49037197 +politics Anyị ekwenyeghị na mpụtara ntuliaka Ekiti, mmerụaka juru ya - PDP "Ntuliaka Ekiti: Otu PDP etinyela ọnụ na ntuliaka e mere n'Ekiti. Ha kwuru sị na agaghị akwọrinwu ha, ma kwuo na ha ekwenyeghị na rịzọọtụ ndị INEC wepụtara na ntuliaka a maka na ọ bụghị nke ọma ya dịka ha sị na ọ bụ APC, ndị ọrụ nchekwa na ndị INEC gbakọrọ aka ọnụ wepụta ya. N'akwụkwọ ozi Kola Ologbondiyan bụ odeakwụkwọ ọha nke Bekee kpọrọ 'National Publicity Secretary' nke PDP niile depụtara, o kwuru na PDP jụrụ rịzọọtụ a maka na mmerụaka dị ya. O kwukwara na ịkpọ Kayode Fayemi onye meriri ntuliaka a bụ ""izu mmadụ ohi n'anya ọcha, nakwa ime ihe na-abụghị uche ndị mmadụ nakwa iwakpo ọchịchị onye-kwuo-uche-ya nke anyị. Ologbondiyan kwuru na rịzọọtụ ndị si n'ebe e mere ntuliaka na gburgburu steeti ahụ gosiri na ""onye PDP bụ Kolapo Olusola-Eleka meriri etu tụrụ n'anya karịa Fayemi, mana Inec gbanwere ya ebe a na-agbakọ rịzọọtụ."" N'aka ọzọ, ọ dị ka Ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na mmerụaka ego na Naịjirịa akpọrọ EFCC a na-eche onye na-achị Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose aka mgba. Maka mmeri Kayode Fayemi bụ onye ga-anọchi Fayose meriri na ntuliaka, EFCC dere na Twitter sị ""Mmemme ebiela, akwa mgbochi ekewaala. Akwụkwọ ikpe mmerụaka gbasara ụlọọrụ ebe a na-azụ anụmanụ n'Ekiti ebe e mefuru naịra nde 1.3 ga-emepe. Anyị ga-ahụ n'oge na-adịghị anya."" Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: EFCC gwara Fayose: Anyị ga-ahụ n'oge na-adịghị anya Ndị uweojii na ndị na-eme ngagharị iwe akụkọtala mpi maka otu nwoke onye uweojii gbagburu maka na o che na o bu egbe. Ndị uweojii atọ merụrụ ahụ, ebe a nwụchiri ndị ngagharị iwe anọ. Frans ebuliela Iko Mbaụwa nke 2018 ka ha ji ọkpụ anọ asatara abụọ merie Kroeshia taa. Mmeri Frans mere ya ugboro abụọ ha ga-ebuli Iko a. Cheta na ha buliri ya bụ iko n'afọ 1998. Ọ bụrụ na Kroeshia meriri, ọ gaara abụ mbụ ha na-erute agba a ma bulie ya bụ Iko Gụọ etu Frans si merie n'uju ebe: World Cup 2018: France ebuliela Iko Mbaụwa 2018 Raymond Aliga bụ nwaafọ Igbo kwenyere n'akụ-ruo-ụl��. Ọ sị na ọ bụ ya mere o ji wulite nnukwu ụlọ ebe a na-arụpụta ihe n'ala Igbo." https://www.bbc.com/igbo/44839629 +business Naira Devaluation: Gịnị ka ọ pụtara maka ndị nkịtị? "Ụlọakụ etiti (Central Bank of Nigeria) ebutuola ego Naịjirịa ka ọ bụrụzie naịra narị atọ na iri asatọ (N380) maka otu dọla. E ji pasentị 24.6 butuo ya site na N360 ọ dịbu na mbụ. Nke a na-abịa dịka ọrịa coronavirus nakwa ihe ndị ọzọ na-emekpa akụnaụba Naịjirịa ahụ. Ọnụahịa mmanụ agbidi nke bụkarị ihe na-enye Naịjirịa ego, na-ada ada na mbaụwa. Nke a mere ka akụnaụba Naịjirịa na-agbadakwa agbada. Ọtụtụ ndị ọkachamara dị icheiche ekwuola uche ha maka mbutu naịra bụ nke Bekee kpọrọ 'devaluation'. Ụfọdụ sị na ọ bụ ihe e kwesịrị ime, ebe ndị ọzọ sị na ọ ga-eme ka ahụhụ na ihe isi ike kawanye njọ. Mmadụ dịka Sanusi Lamido, bụbu onyeisi CBN, kwuru na ya bụ mbutu naịra adịghị mma n'oge a, mana Kingsley Moghalu, onye rụburu ọrụ dịka osote onyeisi CBN, sị na ọ ka mma ka e butuo ya. Mana ndị nkịtị aghọtachaghị ihe okwu a bụ 'devaluation' pụtara maọbụ etu ọ ga-esi metụta ego akpa ha. 'Devaluation' ọbụ ihe ọjọọ ka ọ bụ ihe ọma Chidi Lemchi, onye ihe banyere ego na akụnaụba doro anya, kọwara na mbutu naịra mara mma ma jọkwaa njọ. Lemchi kwuru na ""mbutu ego ga-eme ka ọnụego mbubata ngwaahịa gbalie, nke ga-eme ka ọnụahịa ihe niile gbalie"", bụ nke Bekee kpọrọ 'inflation'. ""Ọ ga-emekwa ka ibite ego raa ahụ maka na ndị na-ebinye ego ga-etinye ego na ọmụrụnwa ha na-ana."" Nke a pụtara na ndị ihe ga-esiri ndị nkịtị ike karịa ka ọ dị na mbụ. Mana Lemchi kọwara na ya bụ 'devaluation' nwere ike ime ka ndị si mba ofesi bata na Naịjirịa ma tinye ego ha, maka na ọ ga-eme ka ọmụrụnwa ha gbalie. ""Ọ bụrụ na ọtụtụ ụlọọrụ si mba ofesi bata Naịjirịa mepee ụlọọrụ ha ebe a, ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ nweta ọrụ."" Ya bụ na mbutu naịra ga-eme ka ọnụahịa ihe oriri na ihe ndị ọzọ gbalie, mana ọ ga-akara akụnụba Naịjirịa mma n'ọdịnihu." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53325461 +politics Kemi Olunloyo: Nnamdi Kanu na Sunday Igboho na-achọ ikposa Naijiria nwere akwụkwọ mba ọzọ "Kemi Olunloyo adụọla ndị ntoroọbia ọdụ ka ha hapụ isozi onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu na Sunday Adeyemo a ma dịka Sunday Igboho bụ onye ndu otu Yoruba Nation. Na mkparịtaụka Olunloyo mere BBC Yoruba na nsonso a, o kwuru na na mmadụ abụọ a na-eti mkpu nwereonwe mpaghara nke ha, nwere akwụkwọ njirimara mba ọzọ. Na ọ bụrụ na ha kposaa Naịjirịa, ha nwere ohere ịgbaga ofesi nke ọtụtụ ndị na-eso ha enweghị ike ya. Ọ sịrị, ""Ihe anyị nụrụ bụ na Ichie Adeyemo nwere akwụkwọ njirimara nwafọ mba Jamini, Nnamdi Kanu nwere akwụkwọ njirimara nwafọ Briten. Ndị nwere akwụkwọ njirimara mba ọzọ bụ ndị chọrọ ikposa ala a."" Ọ gara n'ihu kwuo na ya ekwenyeghị na nkewa Naijiria, na ọ kaa mma ka Naijiria dịrị n'otu. O kwuru na e wepụ Ọdịda Anyanwu, na Naijiria agaghị enwe isi dịka ndị gbaliburu ya dịka Awolowo na Akintola emelighi ya. ""Akwadoghị m 'Yoruba Nation' mana akwadoro m ihe Ichie Sunday Adeyemo (Sunday Igboho) na-eme ịlụrụ ndị obodo ya ọgụ. ""Akwadoghị nkewa Naijiria n'ụzọ ọbụla, ihe m kwenyere na ya bụ 'One Nigeria'.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-58106045 +politics Donald Trump sị na ya ga-eme iwu banyere soshal midia dịka ọ na-agbarụrụ Twitter ihu "Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ga-ebinye aka n'iwu si ya n'aka ga-emetụta ụlọ ọrụ soshal midia, dịka ụlọ ọrụ ya siri kwuo. Atụmatụ a na-abịa ka Trump dọrọ aka na ntị na ya ga-agbachi ụlọ ọrụ soshal midia ọ sị na-apichi ọnụ ndị kwenyere na okwukwe ""conservative"". Ekwubeghi etu iwu ọhụrụ Trump a ga-adị. Okwechaghị nghọta ụdịrị ihe Trump nwereike imenwu ma ya bụrụ na ndị Omeiwu ewpụteghi iwu ọhụrụ ga-enye ya ikike. Ndị ụlọ ọrụ Trump enyeghi ozi ọzọ banyere atụmatụ a bụ nke a na-ele anya na o nwereike ịbinye aka na ya n'ụbọchị Tụzde. Trump na-ebo Twitter ebubo mmegide ndị otu ya mana onweghi akaebe o nyere banyere nke a. O mechiri otu ihe o dere na Twitter site na ikwu ""Ugba a ha apụọla ezigbote ara. Na-elekwa!!!"" Okwu na-ere Trump na ụlọ ọrụ soshal midia senyitere isi ọzọ n'ụbọchị Toozde dịka etinyere akara nyocha n'otu ihe o dere na Twitter. Twitter dere na ihe Trump dere banyere mpụ na ntuliaka Amerịka ""enweghi akaebe"" ga-egosi na ọ bụ eziokwu N'ụbọchị Wednesde Trump kwusiri ike na ya ""ga-eji ike hazie"" ma ọ bụ ""gbachie"" ogige soshal midia. Ọ gwara mmadụ nde iri asatọ na-eso ya na Twitter na ndị na-akwado pati Repụblikan ndị chere na ogige soshal midia ""na-akpichi ndị conzavative ọnụ kpam kpam"", na ya agaghi ekwe ka nke a mee. Oneyisi Twitter sara ihe Trump kwuru site n'isi: ""Anyị ga na-egosi ozi akwụghị ọtọ banyere ntuliaka Amerịka n'ụwa dum."" Maazị Trump dekwere otu ihe ahụ o dere na Twitter na Facebook mana onweghi akara nyocha etinyere na ya. Na mkparịtaụka o mere na Fox News ụbọchị Wednesde, onyeisi Facebook bụ Mark Zukerberg sị na ịkpịchị ogige soshal midia ọnụ abụghị ihe o che gọọmentị na-eti mkpu mkpịchị ọnụ kwesiri ime. Twitter jizi aka ike eso akụkọ ụwa ugbua maka nrụtụ aka ndị mmadụ mere banyere etu ha si eme maka ụdịrị akụkọ ahụ." https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-52798585 +sports Zidane, Xavi na Iniesta onye bụ ọkaibe n'egwu bọọlụ? A kọwa akụkọ ndị na-agba bọọlụ nke ọma n'ebe etiti, aha ndị dịka Zidane, Xavi na Iniesta ga-agbapụta ezigbo ihe. Aha ndị a nwuru ọkụ na soshial midia dịka ọtụtụ ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya na-akọwapụta onye ha chere bụ ọkaibe. Zinedine Zidane bụ nwaafọ mba Fransị, ọ gbara Real Madrid bọọlụ ma bụrụ onye nchịkọta ha ugbua. Zidane mabutara Iko Mbaụwa n'afọ 1998 dịka ọ na-agbara mba ya bụ Fransị bọọlụ. Xavier Hernandez Creus e ji Xavi mara bụ nwaafọ mba Spen gbaara otu egwuregwu Barcelona bọọlụ. Ọ mabutere Iko Mbaụwa mgbe ọ na-agbara mba Spen bọọlụ n'afọ 2010. Andres Iniesta Lujan bụ nwaafọ mba Spen gbaara otu egwuregwu Barcelona bọọlụ. Iniesta mabutere mba Spen Iko Mbaụwa n'afọ 2010. Ụfọdụ ndị họrọ Zidane dịka ọkachaibe n'ime ndị a: @iam_Mubarak7 sị ka enye ya naanị Zidane na osisi kpọrọ nkụ iri na ọ ga-amabute Iko Champions League Mana ndị ọzọ sị na Xavi na Iniesta ka Zidane agba bọọlụ. @CaliforniaPato https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48843388 +politics Rochas Okorocha: A hapụrụ m naira 42.5b n'ọba ego Imo steeti Aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ hapụrụ ego ruru Ijeri naira iri anọ na abụọ n'ụma (N42.5 billion)n'ọba ego Imo steeti. O kwuru na ọ chọrọ ka Emeka Ihedioha na-abata ọkwa gọvanọ ghara inwe ihe ọbụla ga-ebochi ya ịrụpụta ọrụ gọọmenti. O kwuru nke a mgbe ọ na-ahọpụta ndị odee akwụkwọ na onyeisi ndị ọrụ steeti ya. Ndị omekome egbuola mmadụ isii n'otu ezinụlọ n'okpuruọchịchị Riyom dị na Plateau steeti. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Matthias Tyopev kwetere na ihe mberede a mere mana ọ matachabeghi ka o si mee. Dịka Legọọs na Abia steeti nwurula ọkụ maka nnyefe aka ọchịchị ọhụrụ 2019 na-enwuru ọkụ na Naịjirịa. Gọvanọ Abia steeti na-enyefe onwe ya ọchịchị hibere ọgbakọ ọ ga-eji gosi ndị steeti ahụ ka ọ ga-esi chịa ha n'agba nke abụọ ya. Gọvanọ meriri na Lagos bụ Babajide Sanwo-Olu ekwuola na gọvanọ Ambode na-apụ apụ enyefela ọchịchị Lagos n'aka ya tupu echi bụ mmemme nyefaka ọchịchị eruo. Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na dịka ọ na-abanye agba ọchịchị nke abụọ na ọ ga-agba mbọ hụ na ndị uweojii na ndị ọkaiwu rụrụ ọrụ ha ọfụma. Ọ rịọrịọ ụmụ Naịjirịa ka ha gba ndị omekome nọ n'agbataobi ha n'anwụ ka obodo naịjirịa nweike ịdọbata ndị oji ego achụ ego si mba ofesi. Ụlọikpe di n'mba South Africa akpụpụla Nwoke ọnye isi ọcha south Africa aha ya bụ Adam Catzavelos ikpe maka ihe onynyo ịkpa Oke agwụrụ ọ mere. O mechara zipu ozi rịo mgbaghara sị na ọ bụ aghọtaghị , kwu kwa na ọ ga eji ndu ya nile echegharị agwa ọjọ ọ kpasoro ndị isi ojii na mba South Africa. Ọtụtụ anwụọla na nrigoro Ugwu Everest Ka akụkọ na-aga, a na-ekwu na ihe karịrị mmadụ iri anụọla n'ugwu Everest kemgbe afọ a. Ọgụ n'ụlọ mkpọrọ na mba Brazil ataala isi mmadụ Mmadu iri anọ anwụọla n'ọgụ dara n'ụlọ mkpọrọ dị na mba Brazil dịka egbuchara ndị ụlọ mkpọrọ iri na ise na ọgụ dara ụbọchị Sunday gara aga na mba ahụ. Ndị ọrụ mkpọrọ na-ekwu na o nwereike ịbụ enweteghị ikuku ọfụma kpatara ọnwụ ndị a. Oji mma egbu awakpola ụmụakwụkwọ nọ na ebe ha na-eche ụgbọala ha ji a ga ụlọakwụkwọ na mba Japan Mmadụ iri na asatọ merụrụ ahụ na ya bụ mwakpo. Nwata dị afọ iri na otu nakwa nwoke dị iri atọ na itoolu so na ndị eji mma mabuo n'ihe mberede a. Onye na-agbara otu egwuregwu bọọlụ Real Madrid bụ Sergio Ramos ekwuola na ọ chọrọ ịpụ n'otu ahụ na-akwụghị ụgwọ orire ya. O kwuru na ọ chọrọ ị ga otu egwuregwu bọọlụ China agbanyeghị na onyeisi Madrid gwara ya na ọ gaghị ekwe ka ọ pụọ na nkịtị. Otu egwuregwu bọọlụ Naịjiria emeghi ihe ha mere ndị Qatar na mmepe asọmpị iko Fifa U-20 dịka ha achịtaghị aja n'ebe otu egwuregwu USA nọ ka ha zutere onwe ha ụnyahụ. Ha mechara jiri ọkpụ goolu abụọ asataghị otu wee merie Naịjirịa. Naịjirịa na Ukraine ga-ezute n'ụbọchị tọzdei na-abịanụ. Nkeji taata https://www.bbc.com/igbo/afirika-48421400 +sports Etu ndị Super Falcons nke Naịjirịa si eke ekike oge ha anaghị agba bọọlụ Asọmpi iko mba ụwa ụmụnwaanyị nke Afrịka na-aga n'ihu ugbua, ebe ndị Super Falcons nke Naịjirịa na-agba mbọ ibute iko a. Asọmpi nke mbụ ha ga-abụ n'ụbọchị Mọnde oge ha na ụmụnwaanyị Saụt Afrịka ga-ezute. Mana dịka ha na-akwado asọmpi ahụ, ka anyị buru ụzọ gosi gị ụmụasa ndị ga agbara Naịjirị bọọlụ n’asọmpi a. Asisat Oshoala Oshoala eritela ọtụtụ nturuugo n'egwuregwu bọọlụ n'ụwa. Ọ gbaarala ọtụtụ otu egwuregwu a ma ama. Mana ekike ya mgbe ọ naghị agba bọọlụ na-achabakwa ọtụtụ n'anya Onome Ebi Onome bụ ọgba bọọlụ riterela ọtụtụ nturuugo kamgbe ọ gbawara otu Falcons. A mụrụ Onome n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Mee afọ 1983. N’afọ 2019, ọ bụ nwafọ Afrịka mbụ gbarala asọmpi Iko Mbaụwa ugboro ise. Ekike ya na-apụkarị ọkụ n’ịntaneti. Ụdịrị isi na-amasị ya bụ ịkpụtu isi ya tee ya uhie ka ọ na-acha anwụanwụ. Chiamaka Nnadozie Ọ bụ mma nwata ka ị ga-elwe anya ka ọ bụ ọchị ya? Chiamaka Nnadozie nwere ha dum. A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Disemba, afọ 2000. Otu egwuregwu ya na mba France bụ Paris FC. Glory Ogbonna Glory bụ nwafọ Igbo a mụrụ n’ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Disemba afọ 1998. Ọ na-agbara otu egwuregwu Santa Teresa FC dị na Spain. Ọ na-ejikekarị ka ụmụnwoke mana mgbe ọbụla o jikere, njike ya na-apụ iche. Osinachi Ohale Osinachi bụ nwa ada topuru etopu, maa mma. A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Disemba, 1991. Otu egwuregwu ya bụ Depotivo Alaves nke mba Spain. Dịka anyị sikwa hụ, ejiji ya na-abụkarị ejiji yitewere nke ụmụnwoke. Ashleigh Plumptre Nwaanyị ọcha a mụrụ na Leicester, England kpebiri n’onwe ya na ọ chọrọ ịgbara Naịjirịa bọọlụ. A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Mee afọ 1998Ọ na mba Briten mana nna ya bụ onye Naịjirịa si na Legọs steeti. Ọ malitere ịgbara Naịjirịa bọọlụ n’ọnwa Febụwarị afọ 2022. Otu egwuregwu ya bụ Leicester dị na mba UK. Ngwa jiri anya hụ ka njike ya si adị mgbe ọ na-anaghị agba bọọlụ. Nicole Payne na nwanne ya Toni Payne Ụmụnne abụọ a na-agbara otu ‘super falcon’ n’azụ na n’etiti. A mụrụ Nicole n’ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2001, mụọ nwanne ya Toni n’ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Eprelụ afọ 1995, na mba Amerịka. Ị hụ ha abụọ jikere, ị ga-eche na ha bụ ndị na-eyiputere ndị mmadụ akwa. Ị gaghị ama na ụmụ asa a ji ịgba bọọlụ mere akaraka. Michelle Alozie Michelle bụkwa nwada ọzọ njike ya na-apụ ọkụ na soshal midia. Ọ bụ nwata na-anaghị atụ ụjọ igosipụta akụkụ ahụ ya na soshal midia n’ejiji ọ na-eyi. Ngwa gbaara anya gị ekeresimesi. Francisca Ordega Kedụ ihe anyị agaghị ekwu maka Francisca? Nwaanyị ma agba bọọlụ, maa mma, ejiji ya bụrụzie elelebe eje ọrụ. Ngwa gbaara anya gị ekeresimesi. Rasheedat Ajibade Ajibade bụ ọmarịcha nwa ọtụtụ ụmụ Naịjirịa ma ọfụma. A mụrụ ya n’ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1996. Otu egwuregwu ya bụ Minsk FC dị na Belarus. Ọ na-achaba gị n’anya? Mee ngwangwa maka na dịka Rasheedat si kwuo n’ọba soshal midia ya, ọ naghịkwa eche onye ọbụla. Ngozi Okobi-Okeghene A mụrụ Nogzi n’ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Disemba afọ 1993. Ọ na-agbara otu egwuregwu Eskilstuna United nke mba Sweden. Rita Chikwelu O teela Rita gbawarala ụmụnwaanyị Naịjirịa bọọlụ. A mụrụ ya n’ụbọchị isii nke ọnwa Maachị afọ 1998. Otu egwuregwu ya bụ Madrid CFF di na Spain Ọ bụ nwaanyị ejiji ya na-eyitekwa nke nwoke, nke mere ụfọdụ ji ekwu na o nwere 'swag'. Halimatu Ayinde Ayinde gbabuuru otu 'Delta Queens' na Naịjirịa tupu ọ gaa ala bekee. Ọ dị afọ iri abụọ na asaa. Ugbua ọ na-agbara otu Eskilstuna United DFF nke mba Sweden. Regina Otu Christu Ucheibe Peace Efih Uchenna Kanu Ifeoma Onumonu Vivian Ikechukwu Chinonyerem Macleans Toochukwu Oluehi Ọ bụ Oluehi na-eyi uwe e dere 1 n'otu ndị Super Falcons. A mụrụ ya n’ ubọchị abụọ nke ọnwa Mee afọ 1987. Yewande Balogun O nweghi onye ka mma iji pịachie akụkọ a karịa Yewande. A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 1983. Yewande bụ nwaanyị topuru etopu, maa mma nwee nnọọ ihu ọchị. Ekike ya bụkwa nke a na-anaghị ahụ ewepụ anya ngwangwa. Otu egwuregwu ya dị n’Amerịka bụ Coppermine United https://www.bbc.com/igbo/articles/cv2710plgevo +entertainment Emeka Morocco Maduka anwụọla ma lakwuru ndị nna ya ochie "Akụkọ na-erụ anyị ndị ugbua bụ na otiegwu a ma ama bụ Emeka Morocco Maduka a na-akpọ 'Morroco nwa Maduka' anwụọla n'ụbọchị 29 Ọktoba nke afọ 2020 ka ọ gbachara afọ 76. Chukwudi Avoaja bụ onye otu jikọrọ ndị na-eti egwu bụ PMAN n'ịchafụ na mpaghara Ọwụwanyanwụ ma bụrụkwa onye ya na Moroco rụkọrọ ọrụ gwara BBC Igbo n'ekwentị na ya bụ akụkọ bụ eziokwu. ""Ọ nwụrụ n'ehihie taa bụ Tọzde ụbọchị 29 Ọktoba, afọ 2020."" Avoaja gara n'ihu kọwaa na ndị otu ha na-akwadobu imere ya emume ncheta afọ ụbọchị ụka na-abịa tupu ya bụ ọdachi adapụta. Morocco,onye Ukwulu dị n'Anambara Steeti, bụ otiegwu a ma ama n'ala Igbo ọkachasị n'iti egwu na-emetụta mmadụ n'ọkpụkpụ. Ọ bụ otiegwu kajara akaja e ji egwu ekpili were mara. Egwu ndị o tiri wuru ewu gụnyere "" Ụba na-ese""; ""Nke onye metalụ""; ""Ihe onye ga-abụ ka ọ ga-abụ"". Na mkparịtaụka Ya na BBC Igbo nwere tupu ọ laa mụọ, dike Igbo ji egwu ya akpọfe ọtụtụ ndị mmadụ kwuru na ọ bụ ọrụ 'electrician' tupu ọbanye iti egwu. Ihe onyonyo a bụ mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọnwa Julaị afọ 2019, tupu ọ nwụọ. Gee nkọwa ya na etu ije ya siri bido n'ihe nkiri a:" https://www.bbc.com/igbo/49000702 +religion Mbaka sị na Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa N'ime vidio a, Fada Ejike Mbaka nke Adoration Ministries n'Enugwu steeti sị na ọ na-akwado Onyeisiala Muhammadu Buhari maka o nwere ihe ọ na-arụ n'obodo Naịjirịa. Onyonyo a sonyere akwa arịrị ndị mmadụ na-ebe maka ka ogbugbu na ahụhụ jupụtara n'obodo site ihe ndị mmadụ kpọrọ ndọlazụ Naịjirịa na-agabiga n'okpuruọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari. Mbaka gara ihu kọwa na Onyeisiala Muhammadu Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa nwere. Cheta na na 2015, Fada Mbaka bụ onye ụkọchukwu Katolik pụtara kwadosieike Onyeisiala Muhammadu Buhari bu ọkọlọtọ All Progressives Congress, ma buokwa amụma na onye bubu Onyeisiala bụ Dọkinta Goodluck Ebele Jonathan ga-ada ntuliaka. Amụma ya a wuru ewu mgbe ahụ mere ka ndị mmadụ na-eche na ya bụ onye ụkọchukwu ọ na-akwado mmadụ na ndọrọndọrọ ọchịchị? Gịnị mere okwu ya maka nsogbu Naịjirịa nwere ji we wuo? Fada Ejike Mbaka bụ ụkọchukwu ndị Katọlik bụrụkwa onyeisi ndị Adoration Ministry bụ ụlọekpere nke o hiwere nke sokwa ụlọụka Katolik n'afọ 1998. Ndị nsonso ya na-ekwokarị n'igwe n'igwe n'ụlọụka ya bụ Adoration Ministries dị n'Enugwu steeti. Ha na-ekwokarị ịbịa kpee ekpere kwa izu. Ama ya dịka onye na-etinye okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ọdịmma ndị mmadụ. Ama ya maka amụma ọ na-ebukarị ndọrịtaụka n'etiti ma ndị nkịtị ma ndị ụkọchukwu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-49355342 +religion Ash Wednesday: Kedụ ihe ịnara ntụ pụtara? "Taa bụ ụbọchị ndị na-ekpere Kraịst n'ụwa niile na-echecta dịka ụka ụbọchị ntụ ""Ash Wednesday"" na Bekee. Ọ bụ ụbọchị ndị na-eso Kraịst na-edebe dịka ụbọchị dị nsọ, ha ga-aga nara ntu n'isi, ụfọdụ na-asọkwa ịta anụ n'ụbọchị a. Mana gịnị ka ịnara ntụ n'etiti isi pụtara? Archbishop nke Canterbury bụ Justin Welby kwuru na ịnata ntụ bụ iji gosi ndabere anyị nwere n'amara Chineke. Ụbọchị ntụ bụ ụbọchị mbụ n'oge Beke kpọrọ 'Lent' nke ndị ụka Kraịst ji echeta ahụhụ Jịsọs tara mgbe ọ nọ n'ụwa tupu ọ nwụọ, wee binyekwa. Na ngwụcha 'Lent' bụ oge 'Easter' mgbe a ga-eme mmemme maka Jịsoso ikwulite n'ọnwụ. Oge a kpọrọ 'Lent' na-eru ụbọchi iri anọ bụkwa oge ndị mmadụ ji ahapụ ụfọdụ ihe na ndụ ha iji dị ka Chineke. Dịka ụlọ ntaakụko BBC siri kwuo ụbọchị iri anọ bụ nke dị mkpa n'ebe ndị ụka Kristi nọ. Gịnị ka ị na-agbahapụ n'ụbọchi iri anọ tupu 'Easter' e ruo? Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" https://www.bbc.com/igbo/47465844 +entertainment Zebrudaya, Okonkwo, Jagua na ejije TV ise nyere ndị mmadụ ọṅụ n'afọ olemole gara aga Igwe onyonyo 'television' so n'otu ihe Teknụzụ rụpụtara nke bụ ọgbaraigbo gharịị. Mana e wepụ ejije, egwu na akụkọ ụwa, igwe TV ga-abụ akpati nkịtị. Ọtụtụ ejije jupụtara na TV taa, nke e ji akụzi ihe, enwerị obi aṅụrị nakwa agbasa ozi dị mkpa dị icheiche. Ị jụọ ndị ntorobịa ugbua aha ejije TV ha ma, ị ga-anụ ihe dịka 'The Johnsons', 'My flatmates', dịrị gawazie. Mana ejije ndị a nwere ndị tọrọ ha, ndị a kpụ n'ọnụ na Naịjirịa malite n'afọ iri abụọ ruo afọ iri isii gara aga. Akụkọ a bụ iji kọọrọ ndị ntorobịa ihe ejije TV dịka ya n'afọ ndị gara aga, ma chetakwara ndị okenye ụfọdụ ejije ndị kpara ha obi ọma. 1. Zebrudaya (New Masqurade) N'afọ 1974 ruo n'etiti afọ 1990 ga, ka ejije a bụ 'New Masqurade wuru ewu. Ihe ọtụtụ ji mara ejije a n'oge ahụ bụ 'Zebrudaya', nke bụ aha onye a kacha mara na ya bụ ejije. Otu egwu e ji mara ya bụ 'Eddie Kwansa bio bio, izu ka mma na nne ji o, bịa o bịa'. Ọ bụ ụlọọrụ ntaakụkọ 'East Central State Broadcasting Corporation', nke mechara bụrụ 'Nigeria Television Authority' (NTA) Enugu, chịkọbara ejije a. Ndị so n'ejije a gụnyere: N'ime ndị a niile, naanị Chika Okpala bụ onye ka na-apụta n'onyonyo n'ejije ndị e ji ere ahịa (adverts) ugbua. Ọ bụ odogwu Igbo bụ Chinua Achebe dere akwụkwọ ọ kpọrọ 'Things fall apart' n'afọ 1958. Mana n'afọ 1987 ka ụlọọrụ NTA tinyere ya n'ejije nke na-egosi na TV kwa izuụka nke wuru ewu ma kpọtụọ akpọtụ n'oge ahụ. Ejije a kọrọ akụkọ maka otu nwoke aha ya bụ Okonkwo nakwa etu o si gbaa mbọ ichekwa omenala obodo ya bụ Umuofia oge ndị ọcha batara. Ndị so n'ejije a gụnyere: Ejije a so n'ejije nke mbụ nke ụlọọrụ NTA mepụtara, ma bụrụkwa nke kacha mee ogologo oge na TV. Ya bụ ejije nke malitere n'afọ 1968 ruo afọ 1988, kọrọ akụkọ maka obodo a kpọrọ Oja, nke eze na-achị ya na-adabere na ndụmọdụ onyeisi ụlọakwụkwọ dị n'obodo ahụ. Ndị so n'ejije a bụ: Ejije a malitere n'ọnwa Eprel afọ 1980 iji mee ka ndị mmadụ mata maka atụmatụ a kpọrọ 'Green Revolution' nke onyeisiala Naịjirịa n'oge ahụ bụ Shehu Shagari wepụtara. Ọ bụkwa ụlọọrụ NTA tipụtara ya, nke onye dere ya bụ Peter Igho Ndị so n'ejije a gụnyere: Nke a bụkwa ejije ọzọ nyere ndị mmadụ ọṅụ n'oge gboo. Akụkọ kwuru na ejije a malitere n'afọ 1968, mana ruo na ngwụcha afọ 1990 ga, ya bụ ejije ka bụkwa egwu eji. Ọ bụ Afolabi Afolayan, onyeọrụ ntaakụkọ NTA n'oge ahụ, dere ejije a ma kpakwaa agwa dịka 'Jagua'. Ejije ndị ọzọ Ụfọdụ ejije ndị ọzọ wuru ewu n'oge mbụ gụnyere: https://www.bbc.com/igbo/afirika-55582006 +entertainment Ekwekwala ka onye nọ na Finland nọrọ ebe ahụ na-emetọrọ anyị ala - Hilda Dokubo Omee ejije Nollywood bụ Hilda Dokubo etinyela ọnụ n'okwu gbasara nọrọ n'ụlọ nke ndị Igbo na-anọ n'oge a. Na mkparịtụka Dokuba na BBC Igbo nwere, ya bụ onye na-azọ ọkwa oche n'ụlọomeiwu nta nke gọọmentị etiti n'okpuru Labour Party dọrọ ndị igbo aka na ntị ka ghara ikwe ka onye ọbụla bata n'ala Igbo mebie ala Igbo. Ọ rịọrọ ka onye ọbụla dị njikere ma ghara ikwe ka onye ọbụla ghọrịa ha nke ga-abụ 'ụbọchị ntuliaka, ndị Igbo anọrọ n'ime ụlọ ghara ịpụta. O kwuru na Igbo nwere ihe niile ha ga-eji edozili obodo ma ọ bụrụ na ndị Igbo ga-etinye uchu ghara ikwe ka onye ọbụla megharịa ha anya. Nke a na-abịa dịka Simon Ekpa bụ onyeisi ndị otu a kpọrọ 'Auto Pilot' nke ndị IPOB mara iwu ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ abalị ise. Dokubo kwuru na ụdị ihe a adịghị ntị ọnụnụ atụmadụ na onye na-enye ụdị iwu a anọghịdị na Naịjirịa cha cha. Kirie ihe niile o kwuru n'uju n'ihe onyonyo nọ n'elu akụkọ a. https://www.bbc.com/igbo/articles/cevdrz8gdkno +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: NFF akwụbeghị ndị Super Eagles ụgwọ Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Ndị IPOB na-achọ inye ndị Ohaneze ọsọ n'ọgbakọ Ohaneze na-akwado ime. Dịka a na-ele anya maka ọgbakọ ndị Ọhaneze chọrọ ime maka ịhazigharị obodo, ndị IPOB ekwuola na ha ga-me ọchụ ebe ahụ ma onye ndu ala Igbo ọbụla gaa ya bụ ọgbakọ. Naịjirịa Nyesom Wike na gọọmentị etiti na-akọrịta ọnụ nke ọhụrụ a. Aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike etiela mkpu na gọọmenti etiti chọrọ igbu ya. Mana ụlọọrụ onyeisiala kwuru na ebubo anụrụma codeine na-ebute na-efegharị ebe niile nke na-ekwesighi nzaghachi. Ebe ọzọ na Naịjirịa Gọọmenti etiti na-ekwu ka ụmụ Naịjirịa ghara iweghachite ndị PDP Na aka nke ọzọ, ụlọorụ onyeisiala ekwuola na ụmụ Naịjirịa nwaa anwa weghachite ndị PDP n'ọchịchị, ị mara na ego niile PDP zuru a natara ha ga-alaghachikwurukwa ha ọzọ. Akụkọ mba ofesi A na-agba mbọ ijide ebola n'ime DR Congo sọọsọ. Ndị na-chọ ịkwụsị ọrịa Ebola na Congo ebidola inye ọgwụ mgbochi a ka na-enyocha enyocha. Ndị ọrụ ahụike ga-ebu ụzọ nara ya bụ ọgwụ. N'egwuregwu, NFF akwụbeghi ndị Super Eagles ụgwọ mana ha ga-akwụ na nso a. Dịka asọmpi iko mbaụwa na-abịa, ndị NFF ekwuola na ha ga-akwụ ndị Super Eagles ụgwọ ha n'oge na-adịghị anya. Super ga-agbakwa otu Athletico Madrid n'Uyo echi n'asọmpi enyi na enyi iji kwado maka asọmpi iko mbaụwa ahụ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa: https://www.bbc.com/igbo/afirika-44193675 +politics Nkwado Ngige atọgbuola Fayose "Chris Ngige ọ kpachara anya kwado Ayodele Fayose kama Kayode Fayemi na nkwado ntuliaka ha nwere n'Ekiti? Akụkọ ruru anyị aka sị na n'ebe ha gara ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị n'Ekiti steeti, Ngige kwuru sị ""ị lụọ nwunye abụọ, ị ga-ama nke ka mma. Fayose bụ nwunye nke ka mma."" Lee ihe nkiri ebe o kwuru ya: Mana na-etufughị oge, Fayose ekelela Ngige maka nkwado o nyere ya n'igwe twita. N'akụkọ ndị ọzọ, Osote gọvanọ Imo steeti ọ ga-apụ? Ndị ụlọ omebeiwu nke Imo steeti bidoro usoro ichutu osote gọvanọ Imo steeti bụ Eze Madumere n'oche taa. Akụkọ a kwuru na e nyela Eze Madumere akwụkwọ ozi e ji achutu ya n'oche osote gọvanọ Imo steeti. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: A ga-achutu osote gọvanọ Imo steeti taa? Victor Ike Oye bụ onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA gwara BBC ihe mere APGA ejighi sonye n'otu ọhụrụ CUPP. Ọ sị na ọ bụghị iwu na pati niile ga-esonye na nke ọhụrụ ahụ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Etu APGA si gbalahụ isonye na CUPP A kpụtachaala mmadụ iri na atọ ahụ tọrọ n'ime ọgba na mba Thaịland. N'aka ọzọ, otu Manchester United akpọọla oku sị na ha chọrọ ka ụmụaka a na onye nchịkọta ha bịa n'ọgbọ egwuregwu ha bịa legharịa anya ma ha gbakee ọfụma. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ụmụaka 12 na onye nchịkọta ha apụtala n'ọgba Thailand Fernando Torres bụ onye a ma dịka dike n'egwuregwu bọọlụ agafeela mba Japan ebe ọ ga-ebido ịgbara ndị otu Sagan Tosu. Ode akwụkwọ Chimamanda Adichie si na okwu na a na-emegide Igbo na Naịjirịa nwere eziokwu n'ime ya, mana ọpụpụ abụghị ihe ga-agwọ ya." https://www.bbc.com/igbo/44787237 +entertainment Etu m siri mụta ịsụ asụsụ itoolu n'agbanyeghị na ahapụbeghị m Naịjirịa - nwata akwụkwọ UNN Chisimdi bụ nwata akwụkwọ mahadum dị afọ 20 na-asụ asụsụ itoolu n'agbanyeghi na ahapụbeghi Naịjirịa. Ọ sị na njem ya na asụsụ malitere dịka mmadụ nyere ya ihe nkiri eji asụsụ Koria mee. Asụsụ Chisimdi na-asụ ugbua gunyere French, Jaman, Koria, Spanish, Igbo, Bekee na ndi ọzọ. Ọ sị na ya na-amụ etu e si asụ Yoruba ugbua. Gee akụko ya n'uju. Akụkọ a si n'aka Nnamdi Agbanelo na Chimezie UcheAgbo https://www.bbc.com/igbo/afirika-55012477 +politics """ Ọ bụ maka mkpachapụ ka ndị Ipob ji azọ nnwereonwe"" – Sheikh Gumi" "N’ụtụtụ a ka onye nkụzị Alakụba a ma ka Sheikh Ahmad Abubakar Mahmud Gumi wuwere na soshal midia maka ihe ọ dere na facebook ya. Gumi sị na ọ bụ maka mkpachapụ mere ndị agbụrụ dị icheiche jị ekopu isi na gọọmentị Naịjirịa. O bidoro n’iji nkwekọrịta ndị omekome na otu obodo bụ Mada nwere na Zamfara were maa atụ. Ọ sị na ọ bụrụ na Gọọmentị Naịjirịa na ndị omekome kwekọrịta, na udo ga-alọghachite na Naịjirịa. O kwuru na nkopu isi otu Ipob ebelatala n'Ọwụwa anyanwụ maka na Peter Obi pụtara ịzọ ọchịchị Onyeisiala, otu Bola Tinubu siri pụta n’ọdịda anwanwụ. Gumi na-ekwusi ike na ọ bụrụ na gọọmentị mee ihe ndị mmadụ chọrọ, na ha agaghị ekopu isi. Ọ sị na “nkopu isi niile a na-eme na Naịjiria gosiri na Gọọmentị Muhammadu Buhari na-achị ugbua, akpọụla afọ n’ala”. Ọ kelere Chukwu na ha apụwala. Gumi kwenyesiri ike na ọ bụ ka ndị Naịjirịa si ahụta ụwa mere ha ndị omekome ịnwe mkparịtaụka. Ọ sị na ndị Igbo agaghị ekweta na gọomentị na ndị omekome ndị ugwu ga-enwe mkparịta ụka maka na ha na ahụta ha ka ndị ajọ mmadụ.. “otu ahụ ka o ga-esi ara onye ugwu ahụ ikweta na gọomentị na ndị Ipob ga-enwe mkparịtaụka”. O kwuru na mkpagbu, nnapụ na mmegbu butere nkopụ isi. Ọ sị na ọ bụ “nwayọ nwayọ ka aga eji rapụta ndị mmadụ n’ihe ha kwenyere”. BBC Juru ya na ndị mmadụ na-eche na ya bụ Sheikh Gumi kwesiri ịnọ na mkpọrọ ugbua maka na ya na ndị omekome na-ayị. Gumi zara, “ndị ahụ amaghị ihe ha na-ekwu. Ha aghọtaghị Naịjirịa”. Ọ sị na ọ bụ enyemaka ka ya na-enye iji mee ka ihe dị mma. O kwuru na ihe na-ese okwu na Naịjirịa bụ okwu agburu. “O bụ ọgụ agburu ka a na-anụ na Naịjirịa. Ndị mmadụ che na ọ bụ gọọmentị ka a na-ebuso agha"". Ọ sị na ya agaghị agba nkiti na-ekiri ka a na-egbucha ndị be ha. O kwuru na ọ bụ aka ka ya na-enye ịzọpụta ndị be ha. Onye ọkaiwu ukwu Naịjirịa bụ Olisa Agbakọba sị na Gumi enweghị ezigbo okwu maka na ya bụ ihe o kwuru bụ ihe ha kwesiri ịma kemgbe. Ọ jụrụ sị, “kedu ihe mere ha jiri mata ya ugbua? Kedu ihe mere ha ejighị mata na ọ bụ oke mkpachapụ mere ndị mmadụ ji ekopu isi na gọọmentị? O kwukwara sị, ọ bụrụ na ha mata na ya ugbua, na taa ka bụ gboo. Joe Igbokwe bụ onye enyemaka Gọvanọ Lagos steeti maka adịmọcha obodo sị na Gumi kpụ nzu ọma ya n’ọnụ, nke pụtara na ihe Sheikh Gumi kwuru bụ eziokwu, ""mmadụ niile a ana egbu bụ maka ndọrọndọrọ ọchịchi""." https://www.bbc.com/igbo/articles/c6p3kwgdd4jo +politics Sunday Igboho sị na ihe dị egwu ga-eme ma ọkọ kọọ Ifeanyi Ejiofor "Sunday Adeyemo bụ onye e ji Sunday Igboho maara adọọla ndị ọrụ nchekwa aka na ntị ka ha hapụ ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor bụ onye ha wakporọ ụlọ ya n'Anambra Steetị na nso nso a. Adeyemo sị na site ugbua gawa na ihe dị egwu ga-eme ma ọ bụrụ na ọkọ kọọ Ejiofor, na onye ọbụla aka ya dị na mwakpo ahụ ga-ata ahụhụ ya. N'akwụkwọ ozi nke Adeyemi wepụtara nke ọnụ na-ekwuru otu Yoruba Nation bụ Oloyemi Koiki wepụtara ụbọchị Wenezde (16/6/2021), binyere aka, ọ kọwara na Ejiofor abụghị naanị ọkaiwu Nnamdi Kanu kama na ọ bụ ọkaiwu Sunday Igbogho nakwa nke Femi Fani-Kayode. o kwuru na nke bụ ugboro abụọ ndị ọrụ nchekwa ga-awakpo ụlọ Ifeanyi Ejiofor, na e gburu onye enyemaka ya ma kpọọ ozu ya ọkụ. Ọ sị na kEmgbe nke a mere na ndị ọrụ nchekwa ewepụtabeghi ozi ọbụla ịkọwa ihe mere ha ji wakpoo ụlọ Ejiofor. Igbogho kpọrọ oku sị ka ndị ọrụ nchekwa tọhapụ ndị niile na-arụ ọrụ n'ụlọ Ejiofor ha nwuchiri na-egbughi oge ọbụla. Cheta na akụkọ kwuru na ndị e che na ha bụ ndị ọrụ nchekwa wakporo ụlọ Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdị Kanụ n'ụbọchi 6 nke ọnwa Juun. Etu a sị ndị ọrụ nchekwa ji wakpoo ụlọ Ifeanyi Ejiofor Ndị Oraifite ekwuola etu ndị ha na-eche na ha bụ ndị agha Naịjirịa nakwa ndị uweojii si wakpoo ụlọ onye bụbụ ọkaiwu onye ndu Indigenous People of Biafra, Nnamdi Kanu n'Oraifite dị n'okpuruọchịchị Ekwusigo, Anambra steeti. Onye bi n'akụkụ bee Ifeanyi Ejiofor n'Oraifite kwuru na ndị ahụ e chere bụ ọrụ nchekwa Naịjirịa wakporo ụlọ Ejiofor n'abalị Satọde ma gbagbuo otu onye ọrụ nchekwa ya ma buru ozu ya. O kwuru na ọ nụkwara na e kpokọrọ ndị ọrụ nchekwa atọ ndị ọzọ na-eche bee Ejiofor mana agbaghị ụlọ ya ọkụ. Ifeanyị Ejiofor depụtara ozi n'akara Facebook ya banyere mwakpo ahụ. Ihe ọzọ mere n'Orafite Onye ọzọ bikwa n'Orafite kwukwara na ụnyahụ na ya nụrụ na ndị obodo Akwa Ukwu dịketere Oraifite gbara ọsọ. Ndị 'unknown gunmen"" wakporo ụgbọala ndị ugwu bu ehi abata Akwaukwu dị n'okpuruọchịchị , gbagbuo ndị ugwu abụọ nọ n'ụgbọala ahụ ma chụsasia ehi ndị ahụ ha bu. Nke a mere ka ndị obodo ahụ jiri ụjọ gbapụ ọsọ maka ụjọ na ndị ugwu nwerike ịbakute ha bọgwara ogbugbu ụmụnne ha. Mana mmadụ abụọ a gwara BBC okwu kwuru na Oraifite ederela duu ugbua mana ndị ọrụ nchekwa ka nọcha n'Akwaukwu maka ụjọ ji ndị obodo ahụ. Mbọ BBC gbara ịnụta n'ọnụ ndị uweojii nọ n'Anambra gbasara mwakpo ndị a mere n'Oraifite nakwa Akwa Ukwu amitabeghị mkpụrụ dịka ndị Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuchitere ha ebubeghị ekwenti ya. Ụda egbe ekweghi anyị rahụ ụra n'abalị - ndị bi n'Ọjịị Imo steeti N'abalị Moọnde ka ndị bi n'Ọjịị gwara BBC na ha enweghị ike ihi ụra n'ihi ụda egbe. Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'Owerri kwuru na Owerri emepewela obere obere, na-agbaenyighi na azụmahịa ebidochabeghi nke ọma. Kemgbe ndị omekome gbara egbe n'ụzọ Ọjịị dị n'Owerri n'ụbọchị Mọnde, ndị ahịa, ụmụakwụkwọ na ndị ọzọ jị ọsọ gbaba n'ime ụlọ ha. O kwukwara na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steetị sị na chụrụ ndị omekaome ahụ ọsọ n'oge ha bịara mwakpo ahụ. Ọ sị na kọmishọna uweojii Imo Steeti bụ Abutu Yaro ezitela ozị sị na ndị uweojii jupụtara n'akụkụ steetị ahụ niile na nchekwa. Akụkọ onye hụrụ ihe merenụ na-ekwu na gọọmenti Abia steeti gbachịrị ahia ndị osisi dị n'okporoụzọ Ikot Ekpene,Umuahia n'ụtụtụ taa (June 7, 2021) maka akwụghị ụgwọ ụtụisi. Nke a mere ka ndị na-ere ahịa nọrọcha n'iro mana ndị ọrụ Bakassi nọ n'ime ụlọọrụ n'ime ahịa ahụ. Ndị chọrọ ịrụ ọrụ ngo n'ime ahịa ahụ nakwa ndị ọrụ Bakassi bidoro nwewe nsogbu nke mere ka otu onye ọrụ Bakassi gbara mmadụ abụọ ndị oru ngo ahụ egbe mana o nweghi onye nwụrụnụ. Nke a mere ka ndị ahịa chụwa ndị Bakassi ahụ ọsọ ma mụnye ụgbọala nakwa ụlọọrụ ha ọkụ. Ọgbaghara a chụsasiri ndị ahịa Timber niile ugbua. BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị uweojii gbasara mkpamkpa a. Ndị oji egbe a na-amaghị ndị ha bụ agbaala ụlọ kọmishọna mgbasaozi n'Imo Steetị bụ Declan Emelumba ọkụ. Emelumba sị na o nweghi onye nwụrụ n'ọkụ ahụ gbara ụlọ ya dị na n'obodo Ubulu-Ihejiofor nke okpuruọchịchị Oru West, n'���bọchị ụka Juun 6, 2021. Ọ gwara ndị ntaakụkọ BBC n'ewkentị na ndị ahụ gbara be ya ọkụ ma repịa ihe niile dị n'ime ya kpam kpam. O kwughi kwa ma a gbara ụlọ ndị dị be ya nso ọkụ dịka ndị ntaakụkọ na-ekwu mgbe ahụ. Emelumba kwuru na mgbe ndị omekome ahụ wakpochara ụlọ Okoliogwo, ha buru ụgbọala gọọmenti a dọsara n'ụlọ ya. O kwuru na ya bụ ụgbọala so n'ihe ndị uweojii napụtara ndị omekome ahụ mgbe ha gara ịwakpo isi ụlọọrụ dị n'Owerri, nke ndị uweojii kwuru na ha kwụsịrị n'ụbọchị ụka, Juun 6, 2021. BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị uweojii gbasara ya bụ mwakpo mere na be kọmishọna. Ndị uweoji nọ n'Imo steeti kwụsịrị ndị ""unknown gunmen"" biara ịwakpo isi ụlọọrụ ha dị n'Owerri ma gbuo otu Joseph Uka Nnachi akpọrọ "" King of Dragons"" na bekee bụ onye e kwuru na-awakpo ụlọọrụ ndị uweojii n'Imo steeti. Ha gbukwara ndị oji egbe anọ ndị ọzọ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Bala Elkana kwuru na ndị omekome ahụ ruru iri wuchiri ebe elekere isi nke ụtụtụ(6:15am) ji ụgbọala ""Hummer"" si Works Layout dịketere ụlọakwụkwọ Alvan Nursery na Pramarị mana mgbe ahụ ka ha na ha bidoro kwatawa mgbọ. Elkana na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka ebe o kwuru na ha zọpụtara otu nwaanyị onye uweojii ndị omekome a nwụchiri ma mebie ogige ebe ha bi. Elkana kwuru na ndị uweojii nwụchịrị otu onye n'ime ha aha ya bụ Stanley Osinachi dị afọ iri atọ ma bụrukwa onye Achi /Mberi, n'okpuruọchịchị Mbaitoli. Osinachi kwetere n'onyonyo na-efegharịnụ na ọ bụ onye otu Easter Security Network nakwa Dragon bụkwa onyesisi otu ESN nọ n'Imo steeti na-eso Nnamdi Kanu. Elkana kwuru na otu onye uweojii merụrụ ahụ mgbe ha na ndị omekome ahụ na-akwata mgbọ ma na-anata ọgwụgwọ n'ulọọgwụ. O kwuru na ha napụtara ndị omekome ahụ, AK-47 anọ nakwa mgbọ egbe ruru puku abụọ nakwa ọtụtụ ogbunigwe. Ọ makwara ọkwa sị, ""Anyị na-enye ndị niile zuru egbe ndị uweoji ruo ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Juun ka ha weghachi ya, makana ọ ga-adị onye ahụ njọ ma anyị bido nzacha anyị mgbe ụbọchị ahụ gachara"". Elkana kọwara na ọgwụ 'Ode eshi' ndị a ha gburu yi n'ahụ ha azọpụtaghị ha. O kwuru sị, ""Anyị chọrọ ka ụlọ oriri na ọṅụṅụ niile nọ n'Owere bido rụwa ọrụ dịka ha si arụ na mbụ, ka Owere lọghachịkwa dịka obodo aṅụrị eji mara ya"". Cheta na n'abalị satọde fotere Sọnde Juun 6, 2021 ka onyonyo a sị na-egosi ụda egbe na-ada n'elu nakwa n'ala n'Owere malitere fegharịwa. Ọtụtụ mmadụ bidoro kwuwe na ha arahụghị ụra maka ọgbaghara ahụ. Mkpa mkpa a na-abịa dịka ụkọchukwu Archbishop nke Owere bụ Anthony J.V Obinna depụtara akwụkwọ ozi degara Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma maka ọgbaaghara nọ n'Imo steeti. Obinna kwuru na ọ gwara Uzodimma na ndị ọchịchị Igbo ndị ọzọ n'afọ gara aga ka ha chekwaa ndị mmadụ nakwa ala Igbo niile gburugburu. O kwuru na ọ bụ maka mwakpo ndị ọchiehi mere o jiri gwa ha ya bụ okwu oge ahụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57375942 +entertainment Nne ọmụgwọ, Ezenwaanyị, Agadi nwaanyị na aha ndị ọzọ a na-etu ụmụnwaanyị Igbo "Ịmụta nwa nwaanyị n'ala Igbo bụ ihe oke aṅụrị maka na a na-ahụta nwaanyị dịka akụ. Nwata nwaanyị a mụrụ ọhụrụ ga-agafe ogogo dị iche iche dịka ọ na-eto tupu o ruo na nka. E nwere aha ndị Igbo na-agbakwunyere ogogo ọbụla ụmụnwaanyị ndị a ruru, nke na-egosipụta afọ ole nwaanyị gbara nakwa ọnọdụ ha nọ. Aha ndị a na-amalite site na mgbe a mụrụ nwaanyị ọhụrụ ruo mgbe ọ kara nka bụrụ agadi, nke gụnyere; Ndị ọkachamara n'omenala Igbo gụnyere Durueke Nwangene na Ihunanya Anusiem tinyere ọnụ na nkọwapụta ọnọdụ ndị a. Nwa nwaanyị Nke a bụ aha a na-akpọ nwaanyị site na mgbe a mụrụ ya ọhụrụ ruo mgbe ọ gbara ihe dịka otu afọ. Ọ bụrụ na o ruo afọ abụọ gawa afọ ,a kpọọ ya 'nwata nwaanyị na-etolite etolite'. O nwereike ọ bụrụ na ọ bụ nwaanyị e bu ụzọ mụọ, a ga-akpọ ya 'Nwada nwaanyị'. Obere agbọghọ A na-akpọ nwaanyị 'obere agbọghọ' ma ọ bụrụ na o tolite site n'afọ itoolu ruo afọ iri na itoolu. Mgbe ahụ e nweela mgbanwe n'ahụ ya nke gụnyere; ịkpụ ara, ịgba ajị abụ na nke ngada, ịhụ nsọ ya nakwa mgbanwe ndị ọzọ. Site n'afọ iri na asatọ gawa ruo afọ iri abụọ na otu, e nwereike ịkpọ ya 'Agbọghọ nwaanyị'. Nwaagbọghọ tozuruoke: Ogogo a bụ mgbe nwaanyị tozuru etozu ịlụ di dịka mkpụrụosisi chara acha na-eche ọghụghọ, Nke a bụ mgbe ọ gbara ihe dịka afọ iri abụọ na otu ruo afọ iri atọ. Ọ nọ na di: Nke a bụ aha a na-enye nwaanyị ma ọ bụrụ na ọ lụọ di. Mgbe ọ lụrụ di ọhụrụ, ndị mpaghara Bende n'Abia Steeti na-akpọ ya 'mgbirichi'. Dịka nwaanyị lụchara di, aha ndị ọzọ a na-etu ya gụnyere Ori aku, Odozi akụ, Oso di eme, Oso di akpa akụ dgz. Di ya maọbụ nwoke nwereike kpọọ ya 'nwunye m', mgbe ahụ ọ ga na-eme ihe a tụrụ anya n'aka ya dịka ị na-achịkọta ezinaụlọ. Nne nwa maọbụ nne ọmụgwọ: Ọ bụ aha a na-etu nwaanyị lụrụla di ma mụọ nwa maọbụ ụmụ. Mgbe ọ mụrụ nwaanyị ọhụrụ ka a na-akpọ ya 'nne ọmụgwọ' mana ọ bụrụ na ụmụ ya tolite a ga-akpọ nwaanyị ji nwa maọbụ ji ụmụ. Mgbe ahụ nwaanyị a nwereike nọrọ n'ihe dịka afọ iri abụọ na otu gbagoo elu. Ọ bụrụ na nwaanyị lụọ di na-amụtaghị nwa, a na-akpọ ya 'Nwaanyị Aga' mana ọ bụ ọnọdụ mwute. Ụfọdụ nwaanyị dị etu a na-anọ n'ihe iru uju, n'ihi na ụfọdụ ndị na-ahụta ya dịka osisi na-amịghị mkpụrụ na-eche ụbọchị a ga-egbutu ya. Ugoeze na lọlọ: Dịka nwaanyị lụrụ dị ma mụọ ụmụ, na-azụ ụmụ ya ka ha na-eto n'otu aka ahụ ọ ga na-etokwa. Ọ ga na-eto ruo ogogo e nwereike chie di ya echichi dịka Eze, Nze, Ọzọ maọbụ Ichie. A na-eso na-echi nwaanyị dị etu a echichi dịka 'Ugoeze, Lọlọ. A na-akwanyere ha ugwu ebe ọ pụrụiche karịa ụmụnwaanyị ndị ọzọ. Ezenwaanyị, Dibia na Nnekwu nwaanyị: Nke a bụ aha a na-etu ụmụnwaanyị maka echichi e chiri ha nke mere ha ji pụọ iche na ndị ọzọ. Ezenwaanyị bụ aha a na-etu nwaanyị na-eme ihe mmiri, Dibia a bụrụ nke a na-etu nwaanyị na-eme ihe mmụọ ebe Nnekwu nne nwaanyị bụ echichi e chiri nwaanyị maka ọrụ ọma ọ na-arụ n'obodo. A na-akwenyechara ụmụnwaanyị dị etu a ugwu pụrụiche. Nwaanyị isimkpe (Ajadụ) Nke a bụ aha a na-akpọ nwaanyị lụrụ di ma di ya anwụọ. Ọ ga-eji otu afọ ruo uju ọnwụ di ahụ ebe ọ ga-ewezuga onwe ya iche na-esoghi ndị mmadụ na-eme ihe ha na-eme. Mgbe otu afọ gachara, a ga-eme omenala iji tọpụ ya na mkpe mana ọ ga na-azakwa nwaanyị isi mkpe. Agadi nwaanyị Mgbe nwaanyị tofere ajadu, o nwere ogogo ọ ga-eru mgbe afọ ya na-agbada ala, a kpọọ ya 'Agadi nwaanyị' Ọ bụ nwaanyị nọrọla ndụ hụ ụmụ ụmụ ya, onye a na-akpọtụrụ n'obodo ma ihe sie ike. A na-ahụta agadi nwaanyị dịka nwoke n'agbanyeghi na ọ bụ nwaanyị, a na-akwenyere ha ugwu dị elu n'omenala Igbo. Agadi bụ ogogo ikpeazụ nwaanyị na-eru mgbe ọ katarala ahụ, n'ihe dịka afọ iri asaa na ise gbadawa ala. Na nchịkọta, uru dị n'ịmata ogogo ndụ ụmụnwaanyị bụ maka igosi nsọpụrụ na nkwanye ugwu. Igbo tụrụ ilu sị na ""ugwu bụ nkwanye nkwanye mere nwaanyị ji mụta ibe ya."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-54372953 +politics Uche Mefor: Mpaghara Ipob nke m nọ na ya so hibe 'Biafra De facto Customary Government' "Ọ bụ n'abalị Satọde bụ ụbọchị 14 nke ọnwa Maachị ka Asarị Dokubo, Uche Mefor, Ralph Uwazurike na ụfọdụ ndị ọzọ zụtere ndị ntaakụkọ n'ọgba ozi Zoom were kwuo na ha ehibela atụmatu ha kpọrọ ""Biafra Defacto Customary Government. Ha sịkwa na Maazị Asari Dokubo ga-abụ onyeisi oche ogige ọhụrụ a dịka Uche Mefor ga-abu onye Ode Akwụkwọ ha. Ihe pụtara na nzukọ ahụ na-aga n'ihu bụ na atụmatụ ọhụrụ sonyekwara na-ịchọ nwereonwe mpaghara Naịjirịa dị n'Ọwụwa Anyanwụ iji kewapụta mba a kpọrọ Biafra. Ugbua, e nwere otu Indigenous People of Biafa (Ipob), nwee otu Lower Niger Congress (LSC), nwee Biafra Indepence Movement (BIM) nakwa Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra (Massob). Mana Uche Mefor gwara BBC Igbo na atụmatụ ha bụ nchịkọta otu ndị a niile ""maka ọdịmma ndị Biafra"". Ọ kọwara ihe mere ha jiri hibe ya bu ogige nakwa ihe mere ha jiri mee Maazị Asari Dokubo onyeisi oche. Ọ sị, ""Ọ bụghị Asari wepụtere onwe ya, na ọ bụ anyị niile weputere ya."" Gụọ akuko a n'uju. Ọtụtụ ọnụ, otu ebumnuche Otu ndị a niile na-ekwu na ha na-achọ otu ihe. Mana, nke bu eziokwu bụ na ụzọ ha si aga dị iche iche. LNC sị na ha chọrọ iso n'ụzọ ha kpọrọ ""Constitutional Force Majeure"" nke ha na otu ndi ọzọ gbakọrọ n'okpuru ogige a kpọrọ ""Nigerian Indigenous Nationalities Alliance of Self-Determination"". Ha kọwara na site n'atụmatụ ""Force Majeure"" dịka nchabi ihe jikọrọ agbụrụ Naịjirịa niile ibu otu mba. Ipob n'onwe ha na-achọ ka emee ntuliaka n'ọnụdụ nke Bekee kpọrọ ""Referendum"" iji mara ndị chọrọ ikewa nwereonwe ha na ndị chọrọ ịnọ na Naịjirịa. Nke bụ eziokwu ma enyochaa ebumnuche otu ndị a niile bụ na, ha chọrọ otu ihe - nwereonwe." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56426232 +politics Ekiti Decides 2022: Ngwaọrụ Inec erutela ndị ọrụ ha aka "Ọtụtụ ndị mmadụ agbakọọla n'ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) dị n'isiobodo Ado Ekiti, ebe ha bịara iburu ngwaọrụ ha ga-eji arụ ọrụ ntuliaka n'ụbọchị Satọde, 18 nke ọnwa Juun. Ndị ọrụ ngo ga-eso arụkwa ya bụ ọrụ gbakọtakwara ịchọ aha ha n'ebe e depụtara ya mado n'ahụ aja, iji mara wọọdụ ebe ha ga-anọ arụ ya bụ ọrụ. Ụlọọrụ Inec amalitela ibuga akụrụngwa e ji atụ vootu n'okpuruọchịchị iri na isii dị n'Ekiti steeti, dịka ha na-akwado ịtụ vootu e ji ahọpụta onye ga-abụ gọvanọ ọhụrụ steetị ahụ. Kemgbe ụnyaahụ, 16 nke ọnwa Juun afọ 2022, ka Inec malitere njem ịsi Ado-Ekiti bụ isiobodo steeti ahụ buga akụrụngwa ndị ahụ n'okpuruọchịchị steeti ahụ niile. Ugbua, ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-akpagharị n'ime ogbe isiobodo ahụ iji gosi ike ha. N'ụbọchị Satode, abalị 18 nke ọnwa Juun afọ 2022 ka ndị Ekiti steeti ga-eji vootu ha kpebie onye ga-achị ha n'afọ anọ na-abịa. Mmadụ 749,065  bụ ndị nwetarala ikike ịtụ vootu (PVC) ga-anọ n'ọgbọ vootu dị 22,244 họrọ otu onye n'ime  mmadụ 16 na-azọ  ọkwa ọchịchị steeti ahụ e ji ndị gụwara isi n'akwụkwọ mara. Ndị ga-azọ ọkwa a gụnyere Abiodun Abayomi nke APC, Olabisi Kolawole nke PDP, Daramola  Roland Olugbenga nke Labour Party, Benjamin Olufemi Obidoyin nke APGA, Adebowale Oluranti nke YPP na Olusegun Adebayo Oni nke SDP. Ndị ọzọ bụ : Adeolu Akinyemi nke Zenith Lapour party, Agboola Olaniyi Ben, Iyaniwura Tope Iefedayo nke NRM, Fatomilola Oladosu nke NNPP, Fagbemi Peter Adegbenro nke APM, Ajagungbale Moses Olajide na Reuben Boye Famuyibo nke otu Accord Party, ebe ụmụnwaanyị abụọ so n'egwu ndị kara obi ahụ bụ Josephine Kemi Elebute-Halle nke ADP na Christiana Modupe Olatawura nke APP. Onye meriri n'ime ndị a ga-anara ọfọ ọchịchị n'aka na-achi gọvanọ steeti ahu bụ Ọkammụta Kayode Fayemi bụ onye ga-anọzu afọ anọ ya nke bu agba nke abụọ ya dịka gọvanọ steeti ahụ. Fayemi chịburu agba nke mbụ ya malite n'afọ 2010 rue 2014,tupu a napụ ya oche n'otele mana ọ lọghachiri zọọ ọkwa gọvano ọzọ n'afọ 2018. Ka ọ dị ugbua, ebe nile n'Ado Ekiti, isiobodo steeti ahụ na-azụ ka ahịa. Obi na-atọ ndị ọkwọugbọala na ndị na-azụ ahịa rịkpọọ dịka ka ha na-agba aka ahịa. Otụ onye ọkwọụgbọala nyere aha ya dịka Jim Chinedu gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo gara Ekiti maka ntuliaka,na ụzọ na ọhịa gara Ekiti na-ekwo dịka ọtụtụ ndị mmadụ gunyere; ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ọrụ nchekwa, ndị ntaakụkọ na ndị ọrụ akaebe nke Bekee kpọrọ 'election observers' na-awụbata kemgbe abalị atọ gara aga maka ntuliaka. Ndị ọrụ nchekwa na-edo dịka ido dịka onyeisi ndị uweojii bụ Usman Baba zitere ndị uweojii 17,374 maka ntuliaka a. Ọtụ onye ntaakụkọ achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na ""ọtụtụ ụlọ nkwụsị ndị njem dị n'etiti ejula, ndị mmadụ na-agazị n'ime ime achọ ebe ha ga-ehi."" Ntuliaka Ekiti afọ 2022 bụ ọpụrụiche n' ọtụtụ ụzọ nke gunyere; Nke mbụ, nke a bụ ntuliaka mbụ a ga-anwalee ma tinye n'ọrụ kemgbe iwu Ntuliaka ọhụrụ nke Naijiria  a kpọrọ 'Electoral Amendment Act"" jiri dị ire.Ndị ọnu na-eru n'okwu na ntuliaka aka si kọwaa, Ntuliaka Ekiti ga-arụtụ etu ntuliaka Onyeisiala ga-adị na 2023. Iji maa atụ: Nke a bụ mbụ a ga-eji igwe BVAS were mee ntulikaa. Ndị ọkacha mara n'okwu ndọrọndọro ọchịchị na-ekwu na atụmatụ BVAS  ga-eme ka wuruwuru belata. Ọzọ,ntuliaka na Ekiti na-abụkarị n'etiti pati abụọ kacha nwe agba na Naijiria bụ  APC na PDP bụ ndị na-em onye chịịa onye ibe ya na steeti ahụ mana ugbua,egwu adagharịala. Ndị ndọrondọrọ ọchịchị Ekiti steeti dọrọ anya na-arụ aka na ntuliaka ga-abụ ọgụ dimkpa anọ n'etiti  APC, PDP, SDP na Labour Party. Aka chụburu steeti ahụ site n'afọ 2007 rue 2010 bụ Olusegun Oni enwetaghị ikike ịzọ n'aha PDP mafee SDP ebe ikike ime nke a n'aha.  Otu onye ụlọmeiwu Nta bụ Leke Abejide kwuru na otu n'ime ihe ga-apụta ihe na ntuliaka nile a ga-eme malite ugbua bụ na ndị a ma ama pati ha jụrụ inye  ikike ịzọ ọkwa ji iwe gaa obere pati, ga enweta mmeri. N'otu aka ahụ, otu Labour pati malitere ikulite na steeti dị iche iche kemgbe Peter Obi banyere pati hụ ma nweta ọkọlọto ịzọ ọkwa onyeisiala. Ebee ka Inec kwụ na ntuliaka Ekiti steeti? Dịka pati dị iche iche na-agba egwu ha mụrụ iji hụ na ha meriri na ntuliaka, Inec ekwuola na ọ bụ ndị Ekiti ga-ekwu onye ga-achị ha. Onyeisi I nec bụ Ọkammuta. Mahmood Yakubu, kwuru na ọgbako ndị e ji okwu ha agba izu na ihe gbasara ndọrọndọrọ na "" Inec agaghị eme ihe ọbụla iji dọnyere otu pati maọbụ megbuo pati ọzọ, mkpa anyị bụ ịhazi etu  e me ntuliaka dịka ọ dị n'iwu"". Ihe mere oge ntuliaka Ekiti jiri dị iche na nke steetị ndị ọzọ na Naijiria Cheta na n'afọ 2019, Ụlọikpe Mkpegharị kagburu mmeri Segun Oni nke PDP oge ahụ meriri Kayode Fayemi dịka ọ nọchara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ abụọ(ọnwa 41). Inec mere ntuliaka mmeju nke nyere Fayemi nke APC ohere ịlọghachi n'ọkwa gọvanọ n'afọ 2010." https://www.bbc.com/igbo/articles/cjlz5p76gydo +business Drop in inflation: Ọnụ ahịa ihe a na-ere n'ahịa adaala n'ezie? Ndị ọkamụta na-agbagha ihe NBS kwuru maka nkwupụta ngalaba na-ahụ maka ngụkọ na Naijiria nke a kpọrọ 'National Bureau of Statistics'(NBS) nke kwuru na ọnụ ahịa adaala karịa etu ọdị n'ọnwa ole gara aga. NBS kwuru na nsonso na ọnụ ahịa ihe na-ada n'ahịa(inflation) agbatuola karịa ka ọ dị n'ọnwa gara aga dịka o jiri 0.18 pasent daa rue 11.22 site na 11.40 pasent ọ bụbu. Mana ụfọdụ ndị ọkachammara n'okwu akụnaụba kwuru na okwu ahụ adabeghị. https://www.bbc.com/igbo/media-49010108 +business Adulterated Fuel: Etu ị ga-esi mata mmanụ ụgbọala adịgboroja "Ọtụtụ ndị ọkwọ ụgbọala na Naijiria okachasị ndị nọ na Legọs steeti na-atamu ntamu gbasara mmanụ ụgbọala adịgboroja nke juru ebe niile ugbua. Nke a na-eme dika ngalaba na-ahụ maka ire mmanụ ụgbọala na Naijiria bụ NNPC kwuru ka eweghachị mmanụ ụgbọala ebidoro ire na steeti ahụ na nso nso a n'ihi na ya bụ mmanụ ụgbọala adịghị mma. Kama tupu ozi a erute ndị mmadụ ntị, ọtụtụ ndị na-akwọ ụgbọala azụtala mmanụ adigboroja ahụ ma tinye n'ime ụgbọala ha. Nke a mere ka ọtụtụ ụgbọala mebie maka mmanụ ụgbọala adịgboroja a. BBC Igbo gara n'ụlọahịa atọ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala n'Asaba, Delta Steeti, wee chọpụta na ụdị mmanụ ụgbọala atọ ndị a na-acha ụcha dị iche iche. Nke a mere anyị ji gakwuru Obi Ejima Okogba, onye bụ ọkaibe n'ihe gbasara mmanụ ụgbọala na etu e si emepụta ya ka ọ kọwaara anyị etu mmadụ ga-esi amata mmanụ ụgbọala adịgboroja na-agbanyeghi etu ọ sị acha. Okogba kụziri ihe gbasara ụgbọala na nnukwu ụlọọakwụkwọ a kpọrọ Asaba Technical College, Asaba ma rụkwaa ọrụ na ngalaba mmezi ụgbọala nke ndị agha Biafra n'oge a lụrụ agha. O kwuru na ọtụtụ ndị na-ere mmanụ ụgbọala na-agwakọ ya na mmanụ ndị ọzọ dịka Kerozin, maọbụ 'Hydraulic', nke na-eme ka ụgbọala na-enwe nsogbu. Okogba kọwara na ezigbo mmanụ ụgbọala na-akọ ngwangwa ma mmadụ metụ ya aka. ""Ngwangwa ị metụrụ ezigbo mmanụ ụgbọala aka, fụọ aka gị ikuku, ọ ga-akọ na-egbughi oge, aka gị ga-achakwa ntụ ntụ."" ""Ọ bụrụ na ọ dịghị otu a, mara na ọ bụghị nke ọma ya.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-60325729 +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Serena bụ akajiakụ mbụ ụmụnwaanyị N'egwuruegwu, Serena Williams bụ akajịakụ mbụ n'ụmụnwaanyị ndị egwuruegwu N'egwuruegwu, a kpọpụtala Ezenwaanyị tenis bụ Serena Williams dịka onye mbụ na ndị akajiakụ n'egwuruegwu ụmụnwaanyị na mba ụwa. Akwụkwọ mgbasa ozi Forbes dere nke a ụnyahụ. Ndị nzụkọ gọọvanọ ọwụwa anyanwụ ebeela akwa Ndị nzụkọ gọọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjịrịa agbarụọla ihu maka etu ha che na gọọmenti etiti sị abado ọrụ mmepe na mpaghara ahụ.Ha kwuru nke a mgbe ha gara ịlebe anya na ihe ndepụtara maka otu gọọmenti etiti siri rụọ ọrụ mmepe na mpaghara n'afọ 2017 bụ nke ha sị na ojucheghị afọ. Mana gọọmentị etiti sị na ha na-enweta oke ruru ha A maala Paul Manafort ikpe ịgba ọsọ ụtụisi Nelson Chamisa bụ onye so zọọ ọkwa ọchịchị onyeisiala ndị Zimbabwe, ekwuola na aka enwe bara na ya bụ ndọrọdọro nke ya na Emmerson Mnangagwa zọrọ ụbọchị anọ gara aga. Mnangagwa mechara merie na ya bụ ndọrọndọrọ dịka e si kpọpụta ụnyaahụ. Minista na ahụ maka ọrụ na Naịjirịa bụ Chris Ngige ekwuola na ọnweghị mgbe gọọmenti etiti ji kweta maka ibuli ụkwọ ọnwa ndị ji otu afọ efe ala nna akpọrọ NYSC na Bekee Na otu aka ahụ, onyeisiala Mohammadụ Buharị kwukwara n'uche ya ka dị na-ịkwado ụmụ amala ahụ ji otu afọ efe ala nna. Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a Lee ihe nkiri anyị https://www.bbc.com/igbo/afirika-45064769 +business How to Link NIN: Etu ị ga-esi jịkọọ NIN na SIM kadị gị "Cheta na gọọmenti etiti dọtịburu oge ụmụ Naịjirịa nwerike iji denye ma jịkọta akara NIN ha na SIM ha. Kama n'ụbọchi Mọnde bụ ụbọchị anọ nke ọnwa maachị afọ 2022 ka Mịnịsta mgbasa ozi bụ Isa Pantami nyere iwu ka egbochie ndị na ejikọbeghị NIN na SIM kadị ha. I nwere ike ịmata akara njirimara onye Bekee kpọrọ ""National Identification Number"" (NIN) site na iji akara 'USSD, n'ekwentị. Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka akara njirimara onye, a kpọrọ ""National Identity Management Commission"" (NIMC), sị ụmụ Naijiria ha pịa *346# n'ekwentị ha iji mata akara 'NIN'. Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ NIMC nyere ndị Naijiria naanị izuụka abụọ iji were denye akara NIN ha n'akawụkwọ ndenye aha SIM ha meburula mbụ. Onye ọbụla nọ na netwọk MTN, Airtel, 9mobile maọbụ Glo, nwere akara USSD nke ya.. Ọ bụ ngalaba na-ahazi nkwụrịtaụka n'ekwentị bụ NCC n'ịchafụ wepụtara amụma ọhụrụ nke mere ya iwu na onye ọbụla nwere ekwentị ga-etinyerịrị akara njirimara ya n'akwụkwọ ndebanye aha ndị nwere ekwentị. Ọ bụrụ na i nwere ekwentị mana idebanyebeghị aha gị mbụ maka kaad njirimara NIN lee usoro ị ga-agbaso iji mee nke a: Nzọụkwụ Mbụ Nzọụkwụ nke Abụọ Nzọụkwụ nke Atọ Ịnata akara 'NIN' gị Gaa na websaịtị National Identity Management Commission [NIMC] website- www.nimc.gov.ng Gaaa na mpaghara websaitị ahụ ebe e dere 'e-ID Card Status Portal' , pịa ya iji maata na ọ dịla nakwa ebe ị ga-aga were ya. Tinye aha gị, aha nna gị nakwa akara NIMC nyere gị maka ịchọ ya ma pịa 'check now'. Oge ijikọ NIN na akara ekwentị ga-ebi n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Febuwarị afọ 2021 Onye na-ahụ maka ihe gbasara iwu obodo nke ndụ ụloọrụ National Identity Management Commission bụ Hadiza Dagabana gwara BBC Igbo na gọọmenti etiti Naịjirịa nyere maka ijikọ National Identity Number nakwa akara ekwenti ga-ebi n'ụọchị itolu nke ọnwa Febuwarị afọ 2021. Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ruo ugbua ha enwetebeghị ya bụ NIN ma ya fọrọ ijikọ ya na ekwenti ha. Cheta na ikwesiri ịjịkọ NIN gị na akara SIM Airtel,Glo na MTN iji eme intaneti. Cheta na ndị ndịọrụ na-arụ na ngalaba ""National Identity Management Commission' (NIMC) gbara abụbụọrụ nso nso a maka enweghị ngwaọrụ zuru oke ịrụ ọrụ ha. Ndị mmadụ ka na-ege nti ka ha mara ma o nwere ihe ga-agbanwe tupu echi e nyere dịka ngwụcha eruo. Gọọmenti Naịjiria ekwuola na ha amalitebeghị usoro iji National Identity Number (NIN) nọchịe Bank Verification Number (BVN). Nke a bụ ihe Uwa Suleiman bụ ọnụ kwụchitere 'Ministry of Communication and Digital Economy' gwara BBC dịka o na-ekwu okwu gbasara akụkọ na gọọmenti ewerela NIN nọchie BVN. Akụkọ pụtaburu na minista na-ahụ maka teknụzụ na Naịjirịa bụ Isa Pantami kwuru mgbe ọ na-eduharị ndị ntaakụkọ iji gosi ha etu ịdebanya aha na NIN sị aga, na gọọmenti etiti nwere ebumnuche ịji NIN nọchie BVN. Mana Uwa kwuru na ọ bụghị ihe mịnista kwuru ka ihe ahụ pụtara. O kwuru na minista na-ekwu maka etu inweta NIN si dị ezigbo mkpa nakwa ezi nchekwa ọ nwere ruru pasenti 99.9. Pantami kọwara na BVN bụ atụmatụ ebe NIN bụ iwu. Gọọmentị Naịjirịa agbatịala oge ha nyere maka idebanye aha na NIN nakwa ijikọ ya na akara ekwentị site ugbua ruo izuụka asatọ na-abịa abịa. Nke a dị n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ mgbasaozi n'ekwentị nakwa ụlọọrụ n'ahụ maka akara njirimara mmadụ. Onye tinyere aka n'akwụkwọ a bụ minista mgbasaozi n'igwe ekwentị bụ Isa Pantami. Cheta na a sịburu na idebanye aha ga-akwụsị n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Fenụwarị, 2021." https://www.bbc.com/igbo/55333085 +politics 'Onweghị onye chụpụrụ Orji Kalu n'ọrụ' - APC Otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke APC dị n'Arọchukwu ekwuola na ụlọikpe ehibere n'Ụmuahia maka mkpesa gbasara ntuliaka achụpụghị Orji Kalu n'oche ya dịka omeiwu nke 'Abia North'. Ha kwu kwara na ha anabataghị mkpebi ụlọikpe ahụ. Ha gara n'ihu kwuo na Ọrji Kalu bụ onye ama ama nwetere ntuliaka puku iri atọ, narị abụo na atọ were meria onye nke otu PDP bụ Mao Ohuabunwa nwetere puku iri abụo, narị asatọ na otụ. Otu APC kwuru na ha ga-eweghachị ikike enyere Ọrji kalu n'ụloikpe mkpesa. Ma kọwakwaa na ụlọikpe ahu nyere iwu ka emegharịa ntụliaka n'ụfọdụ ọgbọ ntuliaka nke dị na 'Abia North'. Ha riọkwara ka ndị otu APC niile dere ma hapụ ka ndị ọzọ tinye ha n'ikpa agwa ọjọọ ma kwu kwaa ka ndị PDP na ndi enyi ha kwụsị igbasa ozi asi maka Orji kalu. N'aka nke ọzo ụlọikpe nyere iwu na Kalu nwereike ịkpeasa ya bụ ikpe mgbe abalị iri itoolu gachara. https://www.bbc.com/igbo/afirika-49641374 +entertainment Isha Sesay: Amaghị m na m ga-adị ime n'afọ 46 n'enweghị di "Onye ntaakụkọ a ma ama n'ụwa ma bụrụ onye bụbu onye ntaakụkọ CNN bụ Isha Sesay akọwapụtala etu o si tụrụ ime n'afọ 46 , na-alụghị di. Sesay , nwa afọ Sieera Leone toor na mba Briten kọọrọ ụlọntaakụkọ Today.com akụkọ ije ya na nsonso a. O kwuru na ọ bụrụ na afa gbara ya oge ya dị afọ 16 na ya ga-eru afọ 46 na-enweghị di, ma tụọ ime, na ya agaghị ekweta. O kwuru na ya haziri ndụ ya chee na ọ bụ etu ya si chee ya ka ọ ga-esi adị mana dịka afọ na-amanye , nwada ahụ lụrụ di nwa mgbe nta mana ọ badaghị kọwara na ya kpebiri ịtụrụ ime oge ya hụrụ na oge na-agbalahụ ya. ""Alụmdi nwa oge mụ na otu nwoke obiọma amịtaghị mkpụrụ, na-afọ mgbara afọ 40, nne m dara n'ọrịa mkpọnwụ ahụ nke enyeghị m ohere ime ihe ọbụla karịa ilekọta ya. Afọ isii gafere m we hụ onwe ka mụ na nwoke ọ na-ewe awa 12 iji saa m ozi zigara ya n'ekwe ntị na ihe mgbama ọjọọ ndị ọzọ."" ""Ka anyị gbasara ka o doro m anya na : na amụghị nwaa ga-abụ ihe m ga-aka tacha onwe mụ ụta na ndụ m."" Sesay abụghị obere mmadụ. Ọ rụrụ ọrụ na CNN afọ 13, gaa nje ọrụ na mba dị iche iche n'ụwa ma mee ọtụtụ ndị ndụ na mba ụwa ajụjụ ọnụ. O deela otu akwụkwọ ma bụrụkwa onye nwere hiwere otu abụghị nke gọọmentị na-enyere ụmụaka ụmụnwaanyị aka. Mana ị bụ nne bụ ihe kachasị agụ ya agụụ. ""Asị m chewa nwoke dị mma ka ọ bịara m di tupu ma amụọ nwaa, o nwere ike oge agbalahụ m. Ya mere ji kpebie iji ụtụtụ chọwa ewu oji site ikpebie ime ihe kachasị atụ egwu n'ụwa: ịmụ nwa n'onwe m. "" ""Ekweghị ka ihe ụwa ga-ekwu napụ ime ihe bụ uche m."" Sesay gbasoro ụzọ IVF were chọta ihe dị ya mkpa mana ọ dịghị ya mfe. ""Kwa mgbe nzukọ mụ na ndị dọkịta, nnyocha ọbara,nyọcha ahụ, ọgwụ na-ahụ agbọọ, na ịwa ahụ maka 'fibroid ma amaghị na ọdị ya so na ịchọta onye a ga-eji uhe ya(sperm donor) so na nsogbu m gabigara."" "" IVF nke mbụ mere amịtaghị mkpụrụ, Ebere m akwa ọtụtụ ụbọchị tụppụ nweta ike mekwa ọzọ ka ọnwa ole na ole gachara."" ""Dọkịta m bere ije nke abụọ ahụ nkenke ka ọ hụrụ na ahụ m anabataghị ọgwụ ọ na-enye m."" "" Nke atọ ya bụ nke m enweghị olileanya rinne bụ nke nọdoro ."" O kwuru na ya tiwapụrụ akwa oge nnyocha gosiri na ya adịla ime. Sesay gara n'ihu kwuo na obi na-atọ ya rịkọọ na agbanyeghị ike ọkwụkwụ, agbọ ọhụhụ, enweghị agụụ nri so ime ọ dị . ""Ọ gaala izuụka a ole na ole m dị ime."" "" Afọ m na-eto kwa ụbọchị mana oge ọbụla m kwuru na 'adị m ime', eji m ezi ịtụnanya ekwu ya. ""Obi m dị m nnukwu ụtọ.""" https://www.bbc.com/igbo/articles/cjme8nr7j1xo +entertainment Arthur Agwuncha Nwankwo: Onye bụ odeakwụkwọ a? "Onye odeakwụkwọ a ma ama bụ Arthur Agwuncha Nwankwo anwụọla. Ọ nwụrụ n'ụbọchị satọde, bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Febrụwarị 2020, n'ụlọọgwụ University of Nigeria Teaching Hospital (UNTH) nke dị n'Enugwu steeti dịka ọ gbara afọ 77. Tupu ọ nwụọ, ọ rụrụ ọrụ na National Democratic Coalition (NADECO) dịka onyeisioche ha. Nke a mere ka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwanyere ya ugwu ikpeazụ ma zigara ezinaụlọ ya ozi itiakanobi site n'ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Femi Adesina. Gọọmentị Anambra steeti kwanyekwara ya ugwu ikpeazụ. E ji ụfọdụ akwụkwọ dịka ""Danda"" nakwa ""Tales out of School"" were mara ya. Otu ndị ọzọ o so na ya gụnyere PMP, People Progressive Party (PPP) nakwa ụlọ mbipụta ọzọ o hibere bụ Nwamife Publishers dị n'Enugwu. Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51354015 +politics Ipob a ga-arịọ Rotimi Amaechi mgbaghara ugbua? "Ndị otu kpọrọ onwe ha Concerned Youths of Niger-Delta (CYND) chọrọ ka ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) rịọ Rotimi Amaechi mgbaghara. Nke a si n'okwu Ipob ziputara, ebe ha sị na ọ bụ ha wakporo ma tie Amaechi bụ mịnịsta na-ahụ maka njem na Naịjiria ihe n'obodo Madrid dị na mba Spen. Cheta na ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful kwenyere na ha bụ ndị Ipob chọrọ iwakpo Amaechi na mba Spen ka ọ gara ọgbakọ maka mgbanwe ihu eluigwe. Amaechi gbara ama ihe mwakpo a n'akara Twitter ya: Amaechi gakwara n'ihu, site n'akwụkwọ mgbasaozi o zipụrụ, kwuo na ndị Ipob akpaghị ya aka, n'agbanyeghị ihe Ipob na-ekwu. Ihe onyonyo ndị Ipob tinyere na soshal midia gosikwara ka ụfọdụ n'ime ha na-ekwu na ha ""enweteghị"" Amaechi. Nke a na-egosi na eziokwu nwereike ịdị n'ihe Minista Njem na-ekwu. BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful ka o tinye ọnụ n'okwu a otu a si na ha na-ekwuru ndị Naịja Delta kwuru, mana ekwentị ya agaghị. BBC Igbo kpọkwara ndị na-ekwuru Maazị Amaechi mana ha sị na okwu a otu a kwuru abụghị ihe ha ga-etinyenwu ọnụ makana ha amaghị ebe ya bụ otu si pụta. Mwakpo ndị nọ n'ọchịchị bụ atụmatụ ọhụru Ipob wepụtara site n'oge ha wakporo onye bụbu osote onyeisi Ụlọomeiwu ukwu bụ Ike Ekweremadu na mba Jamini. Nyocha BBC Igbo mere maka otu CYND a gosiri na ọ bụ ka ha wepụtara okwu a ka ebu ụzọ nụ maka ha. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50712066 +health World Mental Health Day: 'Obi ịdamba mere ka m chere na igbu onwe m kara m mma' Nwaada rịaburu ọrịa obi ịdamba kọwara ihe butere ọrịa a nakwa ihe ndị ọ hụrụ n'ime ọnọdụ a obi ịdamba. O kwuru na ọ nweghi ike ịkọwa ihe kpatara obi ji na-ada ya mba ma ọ bụrụ na a jụọ ya. Nwaada gara n'ihu kwuo na nke a mere o ji chee na igbu onwe ya kaara ya mma. Ọ dọkwara ndị mmadụ nwere obi ịdamba aka na ntị ka ha gaa n'ụlọọgwụ iji nyere onwe ha aka. Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50002728 +politics Senator Utazi: Ihe mere m ji gbajuo ike akụrụmgwa 'Constituency Project' mgbe okwesiri "Omeiwu na-anọchịte anya Enugwu Nọt bụ Chukwuka Godfrey Utazi azarala ọnụ ya maka ebubo ngalaba na-ahụ maka nrụrụka na mpụ bụ Independent Corrupt Practices Commission (ICPC) boro ya. ICPC kpọchiri be Maazị Utazi n'ụbọchị anọ nke ọnwa Ọgọst ma bo ya ebubo na oburu akụrụmgwa gọọmentị so n'usoro Bekee kpọrọ ""Consistuency Project"" dowe na be yaghara ike ya ndị mmadụ etu o si kwesi. Sịnetọ Utazi malitere okwu n'ịsị na ọ bụ ndị iro na-agba ya mgba okpuru butere okwu a. Ọ sị na nke a bụ ugboro atọ ọ ga-eme atụmatụ ""Consistuency Project"" kemgbe ya banyere ọkwa dịka onye omeiwu. ""Ihe mere m ejighi kee nke a n'afọ gara aga bụ na m chọrọ ike ya mgbe ezumike m. Achọghịkwa m ike ya mgbe ndọrọndọrọ ka ndị mmadụ ghara iwe ya na m chọrọ iji ya zọta vootu.""" https://www.bbc.com/igbo/49276183 +business Apprenticeship scheme: Ihe a Igbo ji enyere onwe ha aka ọ na-alazi ala? BBC Igbo bara ịme ahịa Ladipo, dị na Legọs, gbaa ndi mmadụ ajụjụ ọnụ maka okwu banyere etu ụmụ Igbo si enye onwe ha aka, site n'atụmatụ akpọrọ ịgba bọyị. Gee ndị anyị gbara ajụjụ ọnụ ntị n'ihe onyonyo a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-46196731 +business Ecowas Single Currency: Ihe i kwesiri ịma maka atụmatụ a "N'ụbọchị 29 nke ọnwa Juun 2019, otu jikọtara mba ọdịda anyanwụ Afrịka bụ Ecowas kwekọrịtara na aha a ga-akpọ ego mmekọrịta mba dị na mpaghara ahụ. Ecowas - bụ otu nwere mba 15 n'ime ya - sị na aha ego ahụ ga-abụ ""Eco"". Nkwekọrịta bịara ka afọ 30 gachara kemgbe amalitere okwu inwe otu ego na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka tinyere ọkụ n'ite atụmatụ a ndị Ecowas na-esi. Mana, ihe ọtụtụ mmadụ amaghị bụ ihe nwepụta ego ọhụru a ga-apụta n'ahịa nakwa na mmekọrịta obodo mba dị iche iche n'ọdịda anyanwụ Afrịka? Ọ bụ n'afọ 2020 ka Ecowas sị na a ga-amalite rewe ego 'Eco' a, mana ọ dịghị ka ndị mmadụ ama maka nke a. Otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ya anụbeghị maka ihe a kpọrọ ""Single currency"". Nke a pụtara na ọrụ karịrị nke ndị Ecowas ga-arụ maka atụmatụ a. Mana ọbụghị naanị ime ka ndị mmadụ mata maka ego a dịrị ndị Ecowas. Ọ bụ n'afọ 1975 ka Ecowas malitere. N'ime mba 15 sonyere n'Ecowas, asatọ - Benin, Burkina Faso, Guniea-Bissau, Ivory Coast, Mali, Niger, Senegal na Togo - na-erikọta ego akpọrọ CFA franc. Atụmatụ 'Eco' a ga-eme ka mba ndị a kwụsị iri CFA franc. Ọfọdụ ndị na-akwado atụmatụ a na-ere etu mba ndị a ji na-erikọ CFA france ka etu Eco ga-esi gaa. Agbanyeghị nke a, onyeisi ndị na-enyocha ihe banyere akụnaụba ọha n'ụlọọrụ PwC West Africa bụ Andrew S. Nevin gwara ụlọ ntaakụkọ France 24 na ""Atụmatụ inwekọ ego a erughi erụ, ọkachasị etinye uche na Naịjirịa ebinyegbeghi aka n'atụmatụ nchịkọta ọdịda nnywanwu Afrịka."" Maazị Nevin gakwara n'ihu sị na inwe otu ego abụghị oke mkpa ugbua. ""Ị ga-ebu ụzọ hazie etu esi eme nkwekọrịta ndị ọzọ e nwere banyere azụmaahịa na mpaghara ahụ, ga zie hazie ihe mmepe obodo."" Farida Adamu bụkwa onye ọkammụta n'ihe banyere akụnaụba kwenyere na Afrịka adịbeghi njikere maka ego nwekọrịta. Adamu sị: ""Ya bụrụ na a ga-eme ya, e kwesiri ịhazị etu e si ere ego bụ nke Bekee kpọrọ ""Monetary Policy"", ọkachasị etu o si metụta mpaghara ndị emepebeghi nke ọma.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48828910 +politics Ọ bụghị obi ọcha ka ndị okenye ndị Ugwu ji na-achọ ka e kewaa Naịjirịa- Ohaneze Ndigbo "Onye odeakwụkwọ ukwu otu Ohaneze Ndigbo bu Alex Ogbonna akatọọla atụmatụ ndị ụfọdụ ndị okenye ndị Ugwu ịga njem maka nkewa Naịjirịa. Maazị Ogbonna sị na ọ bụghị n'obi ọma ka ndị okenye ugwu ji na-eme ihe a ha mere. Ọ sị: ""Ihe ha na-achọ bụ ịhu na ọchịchị Naịjirịa ruru ndị Igbo, ka ha mee ihe ọbụla ha ga-ame ka ọ ghara iri anyị aka. Ha na-agba mbọ ụzọ ọbụla ha ga-eji akwanye ọkụ, eji okpuru nzuzo ka ọchịchị ghara ndi Igbo aka. ""Ha were okpuru nzuzo dị icheiche ka asi na ndị Igbo na-egbu mmadụ ka ewere sị na ndị Igbo naghị eweta ""President"". Maazị Ogbonna sị na dịka e nwere otu abụọ n'ọwụwa anyanwụ - Otu ndị nke chọrọ ka e si Naịjirịa pụọ na ndị nke sị ka anọdị. Ọ sị: ""Ndị nke sị ka apụọ bụ ndị okorobịa . Jụzịanụ m etu onye sị na ya bụ okenye ga-ewere nke okoroọbịa hapụ nke okenye? ""Ihe a ọ na-eme abụghị na ọfụka gị n'anya na-achọrọ ka nayị pụọ apụ. Mba! Ọ bụ ụzọ a ga-eji hụ na ihe nayị na-achọ ka anyi ghara inwete ya."" Maazị Ogbonna sị na onye ọbụla bụ onye Igbo sachaa anya ""makana ihe di n'ala Igbo onweghi nke onye Hausa nwee, onweghi nke onye Yoroba nwee. Mana a gaa na be ya ihe ndị Igbo nwere bụ ọkankụ"". Ọ sịkwa na a na-emegidi ndị Igbo nke mere ụmụ okoroọbịa ji ewe iwe, mana ọ sị na ihe Ohaneze chọrọ bụ ka echekwaa ihe ndi ndị Igbo nwere dịka ""anyị na-edozi obodo anyị."" O mechara kwuo na ya bụrụ na a ga-apụ, ọ bụghị giri giri a ka a ga-eji pụ. Cheta na ụfọdụ ndị okenya na Kano Steeti agbaala akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja n'arịrọ ka ụlọikpe a manye ndị ụlọomeiwu nta na nke ukwu ka ha malite usoro ga-enyeaka ịme ka ndị Igbo nwere onwe ha Naịjirịa tupu e megharịa akwụkwọ iwu Naịjirịa. Ndị gbara akwụkwọ a nke akara ya bụ FHC/ABJ/CS/538/2021 bụ Nastura Ashir Shariff, Balarabe Rufa'I, Abdul-Aziz Sulaiman na Aminu Adam. Ndị a sị na iwe ha sitere na mkpọtụ niile otu dị iche iche na-eme gbasara nwereonwe na Naịjrịa. Ndị a gbara ya bụ akwụkwọ gụnyere onyeisi ndị Sineti bụ Ahmed Lawan, onye nke House of Representatives bụ Femi Gbajabiamila na ndị ọkpakọ ha niile na Abubakar Malami bụ Ọkaikpe Ukwu Naịjirịa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58112690 +business Abakiliki Rice Mill: Ihe mere ndị ọrụ osikapa ji mee ngagharịiwe n'Abakiliki "Ụlọahịa ebe a na-ere osikapa n'Abakiliki, Ebonyi steeti na-ewe iwe maka oke ụtụ isi gọọmentị steeti ahụ na-ana ha. Nke a mere ha ji malite ngagharịiwe n'ụbọchị Tuzde nakwa Wenezde a iji kwuo na ya bụ ihe ezuola. Ọnụ na-ekwuru ndị ahịa ahụ bụ Irem Bernard Obinna kwuru na ya bụ ihe malitere kamgbe onyeisi ọhụrụ aha ya bụ Samuel Ogodo bidoro ọchịchị. Obinna kwuru sị: ""Ọbụghị ntuliaka ka Samuel Ogodo ji bụrụ onyeisi ahịa anyị."" ""Gọọmentị webatara ya dịka onyeisi nchereoge a kpọrọ 'caretaker chairman"" ""Mana kamgbe afọ abụọ na ọkara, naanị ihe mgbu ka ọ na-ewetara anyị ebe a."" ""Ụtụ isi ọ na-ana anyị ebe a karịrị akarị. Tupu mmadụ ebubata akpa osikapa ebe a, onye ahụ ga-akwụ naịra 250 maka otu akpa 50kg."" ""Tupu onye ahụ ebupu otu akpa osikapa ebe a, onye ahụ ga-akwụ naịra 370."" ""O wepụtara akpa osikapa nke o tiri iwu na onye ọbụla ga-ejiriri na-etinye osikapa ya. Otu akpa ahụ bụ naịra 300, n'agbanyeghi na akpa ahụ esighị ike."" ""O tiri iwu na ndị niile nwere igwe e ji esu osikapa ga-esiriri n'aka otu onye na-agbata mmanụ ha na-etinye n'igwe ha, mmanụ 'diesel' ahụ bụ adigboroja."" ""Ọ na-anakọ ndị niile nwere ọdụahịa ebe naịra 500 kwa ọnwa nke ọ kpọrọ 'environmental levy'."" ""Anyị amaghị ma Gọvanọ Dave Umahi ọ makwa maka ihe niile a na-emenụ, ya mere anyị ji eti mkpu."" BBC gbara mbọ ịnụ n'ọnụ Samuel Ogodo bụ onyeisi 'Abakiliki Rice Mill', mana o kwuru na ya enweghị ihe ọbụla ọ ga-ekwu. Mana o mechara ziga ndị mmadụ ka ha gwa ndị ahụ na-eme ngagharịiwe okwu ma kwe nkwa na ha ga-eleba okwu ndị a anya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57160393 +entertainment Igbo Music: Egwu anọ e ji mara ndị Igbo "Egwu bụ ihe e ji mara ndi Igbo. Igbo bụkwa ndị egwu na-amasị nke mere na ị ga-ahụta ya n'ihe dị iche iche Igbo na-eme. Ma ọ bụ ihe aṅurị, maọbụ ihe nwute, Igbo nwere egwu ha nwere maka emume ndị a. Igbo na-asị na agadị nwaanyị anaghi aka nka n'egwu ọ maara agba, nke mere na edemede a ga-egosipụta ụfọdụ egwu e ji mara ndị Igbo. Ọ bụghị iwu na egwu a niile bụ ndị Igbo bidoro iti ha, kama ọ na-amasị ndị Igbo, nke mere na e jizi ya mara ha. BBC Igbo juru ọkachamara n'ihe gbasara egwu Igbo na Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka bụ Gerald Maduabuchi Eze, ajụjụ maka isiokwu a, soro anyị ka ị mụta ihe ọ gwara anyị: Eze sị na 'Highlife' bụ egwu na-amasị ndị Igbo nke ọma. Ọ sị na o nweghị onye ga-asị lekwa ebe 'Highlife' siri bido, mana ụfọdụ na-ekwu na o sitere na mba Gana. Akwụkwọ 'Encyclopedia Britannica' kọwara na ""Highlife"" bidoro na ngwụcha nchịkọta oge ndị Bekee kpọrọ ""19 century"". Akwụkwọ a na-achịkọta amamihe kọwakwara na ọ bụ egwu ọdịnala na nke Bekee kpọrọ ""Jazz"" ka e ji mejuputa Highlife. Eze kwuru na ""otu ihe anyị ma bụ na Gana, Naijirịa na Siriya Lone nwere aka n'ihe gbasara mbido egwu Highlife. ""Ị nwereike ịsị na mba atọ ndị a nwere aka n'ihazi egwu Highlife ka ọ bụrụ ihe ọ bụ taa."" Ọ sịkwa na tupụ a kpọwa ya Highlife, aha e jibu mara ya bụ ""Pammy Music"". Dịka aha ya bụ Highlife, ọ bụ naanị ndị ọgaranya ka a na-akporọ egwu a, mana ka oge na-aga mmadụ niile bidoro gewe Highlife. Ndi ọkammuta n'ihe gbasara egwu dịka Eze na-akọwa na o nwereike ịbụ mgbe ndị ọcha bịara Afrịka ka ha kuziere ndị Afrịka etu e si akpọ ụbọ. Ka oge na-aga, ndị Afrịka bidoro were ụbọ na-agụ egwu akụkọ ifo na egwu ọdinala ndị ọzọ. Nke a kacha bụrụ ihe ngosi na-akọwa etu Highlife siri bido. Njirimara Ị gee Highlife nke ọma, ị ga-anụ ụda ọdinala na ụfọdụ ihe egwu bụ njirimara ndị Afrịka. Akụrụngwa egwu kacha pụọ iche na Highlife bụ ụbọ Bekee nke a na-akpọ 'Electric Guitar'. Ịgba, ekwe, ịchaka na ụfodụ ngwa ndị ọzọ na-eso n'egwu Highlife. Ndị ọsụ ụzọ Igbo niile gburugburu na-akpọ egwu Highlife, ọkachasị ndị Anambara steeti. Ụfọdu ndị mere ka e jiri Highlife mara ndị Igbo bụ Prince Nico Mbarga, Osita Osadebe, Oriental Brothers na Oliver De Coque. Mbido Ekpili bụ egwu nnanna anyị ha bidoro nke mere na o nweghị onye nwere ike ikọwali mgbe o jiri bido. Njirimara O bụ ọkpọkọrọ, ịchaka na Ekpili bụ ngwa egwu mere ka egwu a pụọ iche. Egwu Ekpili na-abukarị 'a kpọọ a zaa'. Ihe nke a pụtara bụ na otu onye na-agụ, ndị egwu ya azaa ya. Dịka Akunwafor Obiligbo si agụ ya, I nwere ike inụ ihe dịka 'Nwanne jirikwa nwayọọ oo' A zaa ya sị 'Ooo Obiligbo onye ọma'. Dịka ọ dị ugbua, ụfọdụ ndị egwu na-etinyekwa ngwa egwu ndị agba ọhụrụ dịka Ubọ Latrik na 'piano'. Onye na-agụ egwu ekpili mara etu e si etu dike aha ka o mee ihe o ji bụrụ dike. Ndị ọsụ ụzọ Ọ bụ ndị Anambara ọkachasi ndi Ọnịcha, Nsugbe, Nteje, Aguleri dgz. na-agụkarị Ekpili. Ọ bụ ndị dịka Akunwafor Ezigbo Obiligbo, Emeka 'Morocco' Maduka, Oliver Sunday Akanite (Oliver D'Coque) na Ozoemena Nwansugbe ndị na-etinyekwa ụbọ oyibo na Piano ka e ji ya mara. Ugbua Ọ bụrụ mgbe gboo, onye na-eti egwu Ekpili anaghi agụ ya maka ego. Nke a mere na onye omekome anaghị anọ ebe onye na-eti egwu Ekpili na-eti egwu . Maka na onye egwu Ekpili ga-agwa ya ihe ọjọọ ọ na-eme n'ihu ya. Mana anyị amaghịzị ma ọ ka dịkwa etu a. Ụmụ ụmụ Obiligbo ka na-etikwa egwu dịka nnanna ha siri tie. 3) Egwu Njima Mbido Dịka Ekpili, Egwu Njima bụ egwu nnanna anyị ha bidoro nke mere na o nweghị onye nwereike ịkọwa mgbe o jiri bido. Njirimara Etu e si agụ Njima na-egosiputa mmekọrịta dị n'etiti ngwa egwu na onye na-agụ ya. Ọ na-adị ka abụ nke ndị Bekee na-akpọ 'Lead and Chorus'. Dịka Perikoma siri gụọ: ""M weere udọ ka m kwụgbuo nwanne m mana obi nwanne mere m o."" ""M were ka m gbuo nwannem mana obi nwanne mere m o"" Ndi egwu ya agụọ: ""Izu ka mma na nne ji ka ị mara"" Ọ bụkwa n'egwu Njima ka ị ga-ahụ onye na-agu egwu ka nye na Oja ma ọ bụ Ekwe na akparịta ụka. Ndị ọsụ ụzọ Ọ bụ Mezuo Okoye (Pericoma) mere ka ndị mmadụ mara egwu Njima. 4) Egwu Ogene Mbido Onye ka anyị ga-ajụ etu egwu ogene siri bido? Anyị a ga-ajụ ndị Enugwu steeti? O nweghị ebe e dere sị lekwa etu egwu ogene siri bido. Njirimara Ihe e ji mara Egwu Ogene bụ na ọ na0-abụkarị Ogene mkpi. A na-enwe nke Nne Ogene na Oke Ogene. Nne Ogene na-ada nwayọ ebe nke na-adasi ike bụ Oke Ogene. Ndị a na-eche bidoro egwu Ogene bụ ndị Enugwu Steeti. Mana ka ọ dị ugbua, ị ga-enweta ya taata n'Ọka, Ụmụuchu, Enugwuukwu na ọtụtụ ebe n'Anambara Steeti. Ụfọdụ ndị na-eti egwu Ogene dịka UduBunch, na-etinye nke ha ịgba. Ụfodụ na-etinyezi ọja, udu na ịchaka. Ndị ọsụ ụzọ Ọ bụ ndị Egwu Ubo Amaọdụ nke Ọkụnanọ bu ụzọ tie egwu ogene ma ree ya dịka ahịa. Ndị dịka Shidodo na-etinye nke ya opi na ngwa egwu ndị ọzọ, Malaịka so na ndị mere ka egwu a wuwe ewu. Anyị sị ka anyi dewe maka egwu Igbo, anyị agaghị edecha edecha. Ndị dịka Area scatter, Nelly Uchendu na Mike Ejeagha bụ ndị dị mkpa n'ihe gbasara egwu Igbo. Kedụ egwu ndị ọzọ ị ma? Lee Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49381103 +politics Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Akpabio agbaghapụla PDP bụrụ onye APC n'eziokwu Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Okwu onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua bụ na Sinetọ Godswill Akpabio bụbu gọvanọ Akwa Ibom steeti emeela ihe dị ya n'obi. Taa ka Akpabio kwuputara na ọ gbajọọla PDP gafee APC. Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki ekwuola na obi anaghị amapụ ndị omeiwu maka mgbochi e gbochiri ha ụnyaahụ. O kwuru nke a ebe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ ọ kpọkuru taa n'Abuja. Gụọ akụkọ n'uju ebe a: Mkparị ọbụla e nyere ụlọomeiwu bụ ụmụ Naịjirịa ka e nyere ya - Saraki Ihe ọma emeerela Simone Gbagbo bụ nwunye onye bụbu onyeisiala ndị Ivory Coast taa, Ọ pụtara n'ụlọ mkpọrọ taa ka ọ nọchara afọ atọ n'ime iri abụọ a gụnyeburu na ọ ga-anọ. Cheta na onyeisiala ndị Ivory Coast bụ Alassane Ouattara, gbagharala ya na ihe karịrị mmadụ 700 ndị ọzọ nso nso a. Otu bọọlụ ụmụnwaanyị nke nta Naịjirịa a kpọrọ 'Falconets' na otu Haiti ga-achịpụ ya n'asọmpi Iko Mbaụwa U-20 echi. Cheta na Germany ji otu ọkpụ merie ha n'egwuregwu nke mbụ ha gbara n'asọmpi a. Otu obodo dị n'Enugwu na-atụ ụjọ na akwa mmiri ha daa, ha na ndị obodo ndị ọzọ agaghị enwezị mmekọrịta ọzọ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-45117736 +politics Uwazuruike akatọọla okwu Nnamdi Kanu Uwazuruike akatọọla Nnamdi Kanu Onye ndu otu MASSOB bụ ralph Uwazuruike ekwuola na ogbo ya nke IPOB bụ Nnamdi Kanu anaghị achụso maka nwereonwe Biafra kama na ọ bụ nke onwe ya. Uwazuruike gara n'ihu kwuo ka ndị mmadụ ghara ige ntị na mgbasa ozi Kanu nke sịrị ka ha emeela ntulika n'afọ 2019. Onye bụbu Gọvanọ Ekiti Steeti bụ Ayodele Fayose ga-aga n'ihu ị nọ n'aka ụlọọrụ EFCC dịka ụlọikpe ukwu dị na Legọs ekweghi atọhapụ ya. Ihe a bụ abalị ise Fayose nọ n'aka ndị EFCC n'ihi ebubo iri na otu banyere mpụ na nrụrụaka ego. Mba Saudi Arabia ekwetala n'eziokwu na egburu onye ntaakụkọ Jamal Khashoggi egbu nke butere oke ihe itimkpu na mba ụwa. Minista mba ahụ na-ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Adel al-Jubeir kwupụtara nke a ma gọọ na aka onyeisiala ha adịghị n'ọnwụ nwa amadị ahụ. Onye nchịkọta otu Manchester United bụ Jose Mourinho agaghị anata ntaram ahụhụ maka ọgbaghara mere mgbe ha na Chelsea zutere n'izuụka gara aga. Otu FA ekwuola na ha adọọla Mourinho aka na ntị banyere agwa ọkpara n'oge ọgbaaghara ahụ. Ihe nkiri nke taa Nnamdi Kanu akpalitela mkparitaụka dị iche iche na social media Ọtụtụ ndị mmadụ ka na-ekwu uche ha gbasara ozi Nnamdi Kanu zipụrụ na Facebook ụnyaahụ. Social media na Naijiria nwurula ọkụ makana mkparịtaụka dị iche iche malitere ebe ụfọdụ ndị mmadụ kwetere n'ihe Kanu kwuru, nakwa ụfọdụ ekweteghị n'ihe o kwuru. N'ime ozi ya, Kanu kwuru na IPOB ka na-alụ ọgụ inweta ala Biafra nakwa na agaghị enwe ezumike ma ọ bụrụ na Biafra apụtaghị dịka ala nwere onwe ha. NLC na-enwe iwe ọkụ Otu na-ahazi ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ekwuola na ha ga-ebido abụbụ ọrụ n'ụbọchị isii n'ime ọnwa Novemba ma ọ bụrụ na gọọmentị emeghị ihe gosiri na ha ga-akwụ ha ụgwọ opekatampe ruru puku naira iri atọ. Ha kwuru na abụbụ ọrụ a ga-abụ nke kachasị ukwu na Naịjirịa. Mmadụ 30 emerụọla ahụ na Canada Mmadụ ruru iri atọ na-eme mme mme na mahadum Clemson n'obodo California na mba Amerịka emerụọla ahụ oge ala ha kwụ ọtọ n'elu ya dakpuru n'ime. Ndị gbatagbata kwuru na ọtụtụ mmadụ gbajiri ọkpụkpụ dị iche iche na ya bụ mberede. Kimi Raikkonen emeriela Lewis Hamilton N'egwuregwu, Kimi Raikkonen emeriela onye ọkwọ ụgbọala bụ Lewis Hamilton, n'asọmpị US Grand Prix. N'asọmpị Premier League, Arsenal na Leicester City ga-asụkọta isi n'elekere asatọ nke abalị taa. Gee nkeji nke taa Lee ihe nkiri nke taa https://www.bbc.com/igbo/media-45937356 +entertainment Jollof Wars: Osikapa Ghana ekweghị m merie n'asompi Jọlọf - Osinri Nigeria "Abass Adebukola bụ onye osiite Naijiria sonyere n'asọmpi 'Onga Jollof Battle' nke afọ 2019, ekwuola na ya bu n'obi na ọ bụ ya ga-emeri n'asọmpi ahụ. Adebukola a ma dịka ""Chef Turay"" kwuru na ọ bụ osikapa mba Gana e nyere ya sie wụrụ ya n'ala"". Adebukola kwuru na ihe ogbo ya onye nke Gana jiri merie ya bụ na o nwere ohere iji osikapa nke ya bịa asọmpi ahụ, ebe ya onwe ya enweghị ohere isi Naijiria weta ihe ọbụla. ""Nsogbu dapụtara abụghị naanị osikapa, ọ gaara aka mma ma na eji m osikapa Naijiria were gaa. Osikapa m nwetara bụ nke Gana nke m weere dịka m siri hụ ya n'ihi na ọ bụghị ihe m chọrọ."" Adebukola kọwara na ikuku menyụrụ ọkụ o ji esi ya bụ nri ugboro ugboro nke mere na jọlọf ya egheghị etu kwesịrị."" Adebukola bụ onye meriri mmadụ 13 ndị ọzọ n'asompi 'Onga Jollof Battle' nke e mere na Naịjirịa, nke mere ka ọ gaa ịnọchite Naijiria na mba Gana n'asọmpi mba na mba. Chef Turay chọrọ ka ndị haziri asọmpi jọlọf ahụ hiwegharịa ya ma nye ya ohere ka ya were osikapa Naịjiria nakwa ngwanri Naijiria were bịa asọmpi ahụ. Ọ gwara BBC sị, ""Ana m atụ anya ka a sọgharịa asọmpi ahụ. Ama m na jọlọf Naijiria ka nke Gana mma mana onye mụ na ya sọkọrọ mpi nwere ihe o jiri karịa m."" E nwere asọmpi 'Onga Jollof Battle' n'Akra dị na mba Gana, ebe ndị osinri abụọ nke si Gana na nke si Naijiria sọkọtara mpi iji mata mba ka esi jọlọf dị ụtọ. Mpụtara asọmpi a gosiri na Gana nwetara 95%, ebe Naijiria nwetara 75%. Sika Mortoo bụ nwaafọ Gana bụ onye meriri n'asọmpi nke afọ a, ritere puku dọla abụọ ($2000), ebe Adebukola nke Naijiria ritere otu puku dọla ($1000). Mmadụ atọ ndị lere nri ma nye mkpebi n'asọmpi ahụ si Gana, Saụt Afrịka na Naijiria, kwadoro jọlọf nke Gana. Jọlọf bụ nri a ma ama n'ọdịda anyanwụ Afrịka nke e ji osikapa, tomanto, ose na ngwanri ndị ọzọ esi. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Lee ihe nkiri ga-amasi gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49485702 +health Imo state covid war: Etu ndị ụlọomeiwu 13 si bute coronavirus n’Imo Steeti "Okammụta Maurice Iwu bụ onyeisi ọgbakọ ehibere maka ibuso covid 19 agha n'Imo steeti ekwuola na mmadụ iri atọ butere coronavirus n'ụlọomeiwu steeti ahụ edopụla onwe ha iche. O kwuru na ndị butere ọrịa a gụnyere ụfọdụ ndị ụlọomeiwu nakwa ndị ọzọ na-arụ ebe ahụ. Maurice Iwu kwuru na onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ onye ji echiche amamihe ya kwuo ka agbachie ebe ahụ ruo mgbe e hichara ya ọfụma ma gba ya ọgwụ na-egbu nje. Kedụ ka ha si bute ọrịa a? Ọkammụta Maurice Iwu kwuru na o nwereike ịbụ site n'aka ndị bu nje a a kpọrọ ""Super spreaders."" N'okwu ya, ""Super spreaders"" bụ ndị bu ọrịa ahụ ma ha amaghị na ha bu ya wee na-akpagharị. O kwuru na ọ bụrụ na gị na ha nọkọta n'ime ebe na-enweghi mpio ikuku si abata, ha nwereike ibunye mmadụ abụọ maọbụ atọ ọrịa ahụ. Kedụ ka e si chọpụta ha? Iwu kwuru na ọ bụ otu onye n'ime ha kpesara otu na-ahụ maka imegide Covid-19 na steeti ahụ, na o nwere ka ahụ si eme ya. Nke a mere ka a sị ya ga nyocha ahụ ya maka Covid-19. Mgbe ọ gara wee chọpụta na o bu nje Covid-19, Iwu kwuru na nwoke ahụ ji aka ya dopu onwe ya na bee ya ebe a malitere ịgwa ndị ya na ha nọkọtarala na nso nso ka ha ga mee nyocha. A chọpụtara Covid-19 n'ahụ mmadụ iri na abụọ ọzọ mere nyocha ahụ nke meziri ha iri na atọ buterela ọrịa ahụ. Iwu kwuru na a ga-emekwa nyocha iji chọpụta ndị ọzọ ha na ndị a nwere mmekọ. O kwuru na etu ọ dị ugbua, onweghi onye ọbụla n'ime ha a chọpụtara nje n'ahụ ha ọhụrụ a, o jituru na njọ. Nwaanyị butere coronavirus n'Imo steeti anwụọla ka ọ mụchara ụmụ ejima ya. Maurice Iwu bụ onyeisioche otu na-ahụ maka ibuagha megide coronavirus n'Imo Steeti gwara BBC Igbo nke a na mkparịtaụka ha nwere n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Juun. Iwu si na ya bụ ọnwụ wutere ha makana ha e nwechala aṅụrị na nwaanyị ahụ mụpụtara ụmụ ejima ya n'agbanyeghị na ọ bu nje Covid-19. O kwuru na e nweekwala ọtụtụ mmadụ butere ọrịa Covid-19 na steeti ahụ gbakerela. Ọ ga-akwara n'ihu kwuo na Imo steeti enyochala mmadụ ruru narị asatọ dịka nyocha ka na-aga n'ihu gbua. Iwu kwuru na steeti ahụ ka na-agwa ndị mmadụ tụmadị ndị na-aga ahịa ka ha kpachapụ anya. Ka ha na-eso ntuziaka niile otu World Health Organisation nyere gbasara mmadụ ichekwa onwe ya maka ibute nje Covid-19." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53149027 +religion TB Joshua Death: Lee foto si ụlọ ụka Synagogue dịka a na-akwamaozu ụkọchukwu ha Lee etu o si a ga dịka a na-eme akwamozu T.B. Joshua n'ụlọ ụka Synagogue dị na Legọs. https://www.bbc.com/igbo/afirika-57762396 +politics Soludo Inauguration: Ebele Obiano arịọla mgbaghara ma kwupụta ebumnobi ya ịzọ ọkwa sịnetọ "Ebelechukwu Obiano bụ nwunye gọvanọ chiburu Anambra Steeti bụ Willie Obiano arịọla mgbaghara maka esemokwu dapụtara n'etiti ya na Bianca Ojukwu na 17 Maachị, 2022 mgbe a na-edu gọvanọ Chukwuma Soludo n'iyi ọrụ n'Awka. Obiano rịọrọ mgbaghara ahụ mgbe ọ na-ekwupụta ebumnobi ya ịzọ ọkwa Sịnetọ ga-anọchi anya Anambra North n'Ụlọomeiwu Ukwu n'Ọka n'ụbọchị Wenezde. Ọkwa sịnetọ mpaghara Anambra- North ọ na-akwadọ ịzọ dị n'aka onye bụbu minista njem ụgbọelu. bụ Seịnetọ Stella Oduah nke pati PDP ugbua. Otu n'ime ndị enyemaka aka ya bụ Obika Chidiebere gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na nne ya ukwu kwupụtara uche n'ịzọ ọkwa ahụ. Ihe Ebele Obiano rịọrọ n'arịrịọ Obiano sị na ọ rịọla gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra ugbua mgbaghara maka esemokwu ahụ mere n'ụbọchị a na-edu ya n'iyi ọrụ. Ọ sị na o mere nke a site n'idegara Soludo akwụkwọ ozi. O kwuru ""Dịka onye udo nke e ji maara m, ọgbaghara abụghị akwa m,"" ""Ekelere m ndị okenye, ndịisi ọchịchị, ndị enyi na ndị Anambra niile ndị kpọrọ m ma gosi nwute ha n'ihe ahụ mere ma nye ma ndụmọdụ."" ""Ndị maara nke ọma ma na kemgbe afọ asatọ m bụ nwunye gọvan���, na agbasoro m ụzọ udo na inyere ndị mmadụ aka."" ""O nweghi ihe m ga-eji kụnye aka maka mmechu ihu ahụ, na-agbanyeghi ihe ọbụla e mere m."" ""N'otu aka ahụ, ana m arịọ ndị gbapụtara ihe niile, ndị Anambra nakwa ndị Igbo mgbaghara maka imechu ha ihu n'emume ahụ."" Mgbe Ebele Obiano na-ekwupụta ihe mere o jiri chọrọ ịzọ ọkwa Sịnetọ n'afọ 2023 n'Ọka, ọ sị na ọ bụ uche Chineke na ọ ga-azọ ọkwa ahụ. N'okwu ya ""Ebumnobi m ịzọ ọkwa a si n'ọkpụkpọ oku ndị obodo m kpọrọ m ka m nọchiteanya ha n'Ụlọomeiwu Etiti. ""Ndị Anambara anwaala ma ma chọpụta na e nwere m mmasị n'ijere ndị mmadụ ozi, igosi ịhụnanya nakwa itinye ọchị n'ihu ndị obi na-adịghị m, a maara m na ọ bụ uche Chineke."" ""Ọ bụ ihe ndị a mere ndị nke m jiri kpebie ma sị ka m bịa jeere ha ozi n'ebe ọ dị ukwuu"". Obiano bụ onye pati APGA bụ pati di ya jiri zọọ ọkwa ma merie dịka gọvanọ Anambara Steetị n'afọ 2014 ruo afọ 2022 ọ rịturu n'ọchịchị. O dobeghi anya ma ọ gbatala akwụkwọ ikike igosi mmasị ya n'ọkwa ahụ nke a kpọrọ 'normination form'." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60948361 +entertainment 2019 Top Searches: Naira Marley, RUGA na ihe ndị ọzọ a kacha chọọ n'ịntanetị n'afọ 2019 Ọbịbịa ịntaneetị emeela ka mgbasa na nzikọrịta ozi dịwanye mfe. Ịchọpụta akụkọ maọbụ onye na-ewu ewu bụzị naanị nkeji olemole ka ọ na-ewe. Dịka afọ 2019 na-abịa n'isi njedebe, anyị mere nchọpụta gbasara akụkọ, isiokwu nakwa ndị mmadụ a kachasị chọọ n'ịntanetị. Lee ha ebe a: Isi akụkọ a kacha chọọ na ịntaneetị 1. RUGA Dịka mwakpo ndị ọchịehi na-abawanye na Naịjirịa, gọọmentị etiti wepụtara atụmatụ ha kpọrọ 'Rural Grazing Area' (RUGA). Mana ndị mmadụ anabataghị atụmatụ ahụ chaa chaa. 2. Abụbụ ọrụ ndị ASUU Abụbụ ọrụ ndị otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum Naịjirịa abụghịzị ihe ọhụrụ. Nke ikpeazụ ha gbara bụ n'ọnwa Febrụwarị 2019 ka ha kwụsịrị ya. N'ọnwa Nọvemba, ASUU jikwa abụbụ ọrụ yijaa gọọmentị n'ihi na ha achọghị iso n'atụmatụ a kpọrọ 'Integrated Payroll Personnel Information System' (IPPIS). 3. Asọmpi iko mba Afrịka Asọmpi iko mba Afrịka afọ 2019 kporo nnukwu ọkụ. Ọ bụ na mba Ijipt ka a gbara ya. BBC Igbo guzoro ka odogwu iwetara ndị Igbo etu ya bụ egwuregwu si gaa. 4. Iko mba ụwa ụmụnwaanyị Nke dịkwa ka ya bụ iko mbaụwa ụmụnwaanyị a gbara na mba Brazil. Ọ bụ ụmụnwaanyị mba Amerịka tuuru ugo na ya. 5. Xenophobia Mwakpo a na-awakpo ndị mbịarambịara na mba Saut Afrịka kawanyere njọ n'afọ 2019. Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa si mba ahụ gbalata n'ihi ya bụ ihe. 1. Naira Marley Onye oti egwu a wuru ewu maka ihe ọjọọ nakwa nke ọma. Nke ọjọọ bụ na ngalaba mgbochi nrụrụaka bụ EFCC kpụpụrụ ya ụlọikpe maka ebubo izu ohi na ịntaneetị. Ikpe ahụ ka na-aga n'ihu ugbu a n'ụlọikpe dị na Legọs. Nke ọma bụ na Naira Marley tiputara egwu ọhụrụ ọ kpọrọ LOL (Lord Of Lamba). Nwaokorobịa a nwere ọtụtụ ndị ntorobịa egwu ya na-amasị. 2. Atiku Abubakar Atiku bụbu osote onyeisiala Naịjirịa, nke so wee zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019 mana kụọ afọ n'ala. Oge e mechara ntụliaka ahụ, Atiku gara ụlọikpe na-ekwu ka e mee ya onyeisiala, mana nke ahụ nyụkwara pịị. 3. Neymar Neymar bụ onye ọgba bọọlụ mba Brazil a ma ama. O wuru ewu na oge ndị mmadụ che na ọ ga-alaghachi otu egwu Barcelona bụ ebe o si pụọ gawa PSG n'afọ 2017. 4. MC Oluomo Oluomo bụ onyeisi ndịọrụ ụgbọala na steeti Legọs. Ọbụkwa onye nkwado Bola Tinubu, aka chiburu Legọs Steeti. 1. Zlatan Zlatan nwetara nnọọ aka nchawa n'afọ 2019. Egwu ya dị ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnụ. 2. Burna Boy Ọnwa Burna Boy na-etizi ugbu a. Nke kacha bụ na ahọpụtara egwu ya maka iso zọọ nrite 'Grammy'. 3. Teni Nwaada a sozi n'ihe a na-eme ugbua. Egwu ya na-atọba ndị mmadụ n'ụbụrụ isi. 4. Kizz Daniel Kizz Daniel tiputara egwu ọhụrụ di icheiche n'afọ a. Ha gunyere 'Pak n Go', 'Ello Baby' na 'Eko'. Ndị na-eme ejije a kacha chọọ 1. Regina Daniels Nwa agbọghọ anaghị agha igosi mma nakwa akụnaụba ya oge ọbụla. Ihe ọzọ kpatara o ji ewu ewu mgbe niile nwere ike bụrụ maka na di ya bụ onye ọgaranya a ma aha ya. 2. Genevieve Nnaji Afọ 2019 maara Genevieve Nnaji nnukwu mma. E wepụtara ihe onyonyoo ya bụ 'Lion Heart' maka ituru ugo 'Oscar'. Mana o mechara ọ dabaghịzị. 3. Tonto Dike Aha ọzọ i nwere ike ịkpọ Tonto Dike bụ 'Azụanụụka'. O wuru ewu n'afọ maka ọtụtụ ihe, otu n'ime ha bụ maka na ọ gara ụlọọgwụ gbanwee ahụ ya nke bekee na-akpọ 'cosmetic surgery'. 4. Hadiza Gabon Hadiza bụ onye na-eme ihe nkiri n'asụsụ awụsa nakwa bekee. Mana ebe a kacha mara ya bụ n'ejije nke ndị awụsa. Ihe nkiri TV a kacha chọọ 1. Big Brother Naija Nke a bụ ihe nkiri kacha ibe ya e mere na Naịjirịa n'afọ 2019 Onye meriri ya bụ nwa afọ Igbo aha bụ Mercy Eke onye e ji Lamborghini mara abụrụla Ugoeze Big Brother Naija. 2. Mehek Nke abụ ihe nkiri a na-eme 'Zee World'. 'Zee World' bụ ihe ejije ndị mba India mana ọ na-amasị ọtụtụ ndị Naịjirịa. 3. Captain Marvel Nke a bụ ihe nkiri nke si mba Amerịka. Ya bụ ihe nkiri wuru ewu oge e wepụtara ya. 4. When they see us Nke a bụkwa ihe nkiri si 'Hollywood'. Ọ na-amasị ọtụtụ ndị Naịjirịa nke ukwu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị ya: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50920136 +sports Nigeria vs Ghana: A zọgbughị Joseph Kabungo, ọ nwụrụ site n'obi nkoropụ - NFF "Otu na-achịkọta egwu bọọlụ na Naijiria bụ NFF n'ịchafụ ekwuola na ọ bụghị nzọgbu maọbụ ntigbu ka e tigburu Joseph Kabungo, onye ọrụ CAF, n'asọmpi Naijiria na Ghana gbara n'ụbọchị Tuzde. Ghana na Naijiria gbara nhatanha (1-1) n'asọmpi ha gbara n'amaegwuregwu Moshood Abiola dị n' Abuja maka onye ga-etozu ịga asompi Iko Mbaụwa nke afọ 2022. Akụkọ fegharịrị kwuru na e tigburu Kabungo bụ onye ọrụ CAF na tigbuo zọgbuo dapụtara n'ama egwuregwu ahụ ozigbo e gbubiri asọmpi ahụ. Mana otu NFF kwuru n'akwụkwọ mgbasaozi ha wepụtara ụbọchị Wenezde, na Kabungo nwụrụ site n'obi nkoropụ dịka o kubituchara mgbe ndị mmadụ na-achọ ụzọ ipụ n'amaegwuregwu ahụ. Ọgbaghara dapụtara n'ama egwuregwu ahụ dịka ndị mmadụ wujuru n'ọgbọ egwuregwu ahụ malite kpawa aghara. Dịka Odeakwụkwọ ukwu nke NFF bụ Dr Mohammed Sanusi sị kwuo, ""Ozi si n'aka dọkịta anyị bụ Dr Onimisi Ozi Salami, bụ onye FIFa họpụtara dịka onye nlekọta ahụike n'asompi ahụ, kwuru na a hụrụ Kabungo ka ọ na-ekuli ume elu na nso ebe ndị Ghana na-agbanwe uwe. E wetara m ozi, m wee nye ha iwu ka ha buga ya ụlọọgwụ."" ""Mana ọ nwụrụ dịka ha na-erute n'ụlọọgwụ."" N'otu aka ahụ, Dr Salami kwuru na ọ bụ obi nkoropụ gburu Kabungo. Dr Salami gwara ngalaba mgbasaozi NFF bụ nff.com na ""ọ nwụrụ site n' obi nkoropụ (cardiac arrest)."" Ọ kọwara na ya na-aga n'ebe mgbanwe uwe ndị egwu bọọlụ Naijiria oge ""onye nchịkọta si Saụt Afrịka bụ Kabore Hubert Bosilong bekuru ya. ""Ka m bịara, ahụrụ m Dr Kabungo ka ọ na-ekuli ume elu."" ""Onye nchekwa Fifa maka asompi a bụ Dixon Adol Okello, onye Uganda, nọ ebe ihe a na-eme.""""Anyị gbalịrị ịkpọlite ya ozigbo mana oge anyị hụrụ na ọ mịtaghị mkpụrụ, anyị tinyere ya n'ụgbọala ụlọọgwụ gbara ọsọ buga ya ụlọgwụ Cedar Crest Hospital dị n'Apo ebe ọ nọrọ kubie."" Dr Salami gara n'ihu tụọ arịrị na ụfọdụ mmadụ tụgharịrị akụkọ ahụ na-ekwuzi na a kụrụ ya ihe. ""Nke a bụ asị, Ọ bụ obi nkoropụ gburu ya."" Dịka Ghana gbapụrụ Naịjirịa n'iko mba ụwa afọ 2022 taa bụ Tuzde, Maachị 29, ndị mmadụ ji iwe malite imebi ihe n'amaegwuregwu Moshood Abiola dị n'Abuja, ebe a nọrọ gbaa ya bụ asọmpi. Onyonyo etu ndị mmadụ si jupụta n'ama egwuregwu ahụ na-akụrịsi ihe na-efesasị ebe niile na soshal midia ugbua. N'onyonyo ahụ, a hụrụ ebe ndị mmadụ na-akụwasị ihe, hụkwa ka anwụrụ ọkụ na-alali elu n'ime ama egwuregwu ahụ. Anwụrụ a dịka ọ bụ ikuku ose nke ndị ọrụ nchekwa na-eji achụsasị ndị mmadụ na-akpa aghara. Ghana na Naịjirịa gbara nhatanha site n'inye onwe ha otu goolu otu goolu. Mana Ghana tozuru iso gbaa asọmpi Qatar 2022 n'ihi na ha nyere goolu n'Abuja mana Naịjirịa enyeteghị goolu oge ha gara Kumasi n'ụbọchị Fraịde, Maachị 25. Ndị Super Eagles nke Naịjirịa akwarala ngwongwo ha laa maka na ha agaghị eso agba asọmpi iko mba ụwa nke ga-adị na mb Qatar n'ọnwa Nọvemba afọ 2022. Ọ bụ mba Ghana ji azịza zapụ Naịjirịa n'asọmpi a dịka ha nyere onwe ha otu goolu otu goolu. Naịjirịa na Ghana nyere onwe ha otu goolu otu goolu n'agba nke mbụ nke asọmpi itozu oke maka iko mbaụwa nke afọ 2022, n'ama egwuregwu dị n'Abuja. Mba Ghana bu ụzọ nyete goolu na nkeji iri na otu nke asọmpi ahụ, site n'aka Thomas Partey. Mana Naịjirịa nyere goolu nke ha site na penariti nke William Troost-Ekong gbara, dịka a gbaturu Ademola Lookman n'ime obi goolu ndị Ghana. Cheta na Naịjirịa enyetaghị goolu oge ha gara Ghana n'ụbọchị Fraịde, abalị 25 nke ọnwa Maachị 2022. Ọ pụtara na dịka Ghana bu ụzọ nyete goolu n'Abuja, ndị Naịjirịa kwesịrị imeri ha emeri iji gafere, maka na nhatanha ọbụla agaghị enwe isi. Fifa nwere iwu a na-akpọ 'away goals rule', nke bụ na ọ bụrụ na a gbaa nhatanha n'asọmpi, ndị ọbụla kacha nyeta goolu n'ụlọ ndị nke ọzọ, ga-enwe mmeri. Naịjiria na Ghana ga-achịpụ ya taa bụ Tuzde, abalị 29 nke ọnwa Maachị afọ 2022 n'ama egwuregwu Moshood Abiola dị n'Abuja, n'asọmpi itozu oke maka iko mbaụwa nke afọ 2022. Cheta na Naijiria na Ghana gbaburu onwe ha onye lawa onye lawa n'asọmpi nke ha sọrọ na Kumasi Ghana n'ụbọchị Satọde gara aga. Ka ọ dị ugbua, ndị Black Stars nke Ghana awụchielarị maka egwuregwu a ịma mbe na abọ nke bụ oke. Ndị mmadụ na-atụ anya na asompi ahụ ga-akpụ ọkụ n'ọnụ n'ihi na mba abụọ a na-apụ ọkụ n'egwu bọọlụ n'Afrika. Ọ bụ n'ihi nke a mere ụfọdụ ji ekwu na ọ hịara ahụ ikwu kpomkpwem onye ga-emeri n'asompi taa. Naijiria na Ghana ejighị anya ahụ onwe ma a bịa n'okwu egwuregwu bọọlụ. Mba abụọ a ezutela onwe ha n'asọmpi iri ise na isii (56). N'ime ndị a, Ghana meriri na iri abụọ na ise (25), Naiijiria meriri iri na abụọ (12), ebe ha gbara nhatanha n'asọmpi iri na itoolu (19). Ma lee asọmpi Iko mbaụwa ha zutere na onwe ha: Kemgbe Naijiria na Ghana zutewere onwe ha n'asọmpi bọọlụ, Naijiria agbaala ha n'ụlọ ugboro iri abụo (20), merie n'asatọ (8), e merie ha n'atọ, ebe ha gbara nhatanha n'itoolu(9). N'aka nke ọzọ, Ghana agbaala Naijiria n'ụlọ ha ugboro iri abụọ na atọ (23), merie n'iri na isii(16), e merie ha n'otu, ebe ha gbara onye lawa, onye lawa isii(6). Ugbua, ọ bụ n'ihu ama Naijiria ka a ga-asọ asọmpi a, kedụ ihe iwu Fifa kwuru? Mpaghara 20.10, ihu akwụkwọ 29 nke Iwu Fifa kwuru sị, ""Ọ bụrụ na otu egwu bọọlụ abụọ nweta ọkpụ bọọlụ ha nhatanha na asọmpi abụọ, ọkpụ ọbụla e nwetara n' asọmpi abụghị n'ụlọ a ga agụ ya abụọ."" Ọzọ, ""Oge mgbakwụnye (extra time) bụ oge dị nnukwu mkpa n'agba nke abụọ...) Ọ bụrụ na otu egwu bọọlụ abụọ enye goolu ha nhatanha n'oge mgbakwụnye, otu bọọlụ bịara abịa ka a ga-akpọpụta dịka onye meriri n'asompi ahụ iji gbado ụkwụ n' iwu ịgụ otu goolu dịka abụọ."" Dịka otu onye egwu bọọlụ doro anya bụ Andrew Ekejiụba siri kọwara BBC Igbo, "" Ihe o ga- eri Naijiria bụ inweta 1-0 maọbụ 2-0 maọbụ 3- iji tozuo ịga iko mbaụwa."" ""Ha ekwela ka Ghana nye goolu ọbụla n'ihi na ọ bụrụ na ha nye goolu ọbụla a ga-agụrụ ha ya ka e si agụ goolụ agbaghị n'ụlọ."" Ihe asọmpị a ji dị ụmụ Naijiria mkpa? Obi na anya ọtụtụ ụmụ Naijiria dị n'asọmpi Naijiria na Ghana nwere taa. A na-atụ anya n'ọtụtụ ndị mmadụ ga-apụta n'igwe dịka ụfọdụ otu pati YPP na ndị ọzọ egwu bọọlụ na-amsị zụọrọla ọtụtụ ndị ntorobịa akwụkwọ ikike ịbanye kirie ya n'amaegwuregwu Moshood Abiola. Dịka Ekejiụba si kwuo, ihe o ji dị Naijiria mkpa imeri n'asompi a bụ na ọ bụ ya ga-ekwu onye ga-aga asompi iko mbaụwa. ""Asompi iko mbaụwa bụrụ otu egwu bọọlụ ọbụla maọbụ onye egwu bọọlụ nnukwu n'ihi na-eji isonye na ya agụkọ onye maọbụ mba bụ ọkaibe n'egwu bọọlụ n'ụwa."" ""Ọ bụrụ na isonye n'iko mbaụwa dịka ọgba bọọlụ, ego ole ị na-ada ga-arị karịa."" Akụkọ ka na-abịa" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-60861616 +politics Nigeria Democracy Day: Ihe Onyeisiala Muhammadu Buhari siri gọọmentị ga-eme ndị na-awakpo ụlọ ndị uweojii n'ọwụwa anyanwụ "Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buharị na ụlọọrụ NTA nwere mkparịta ụka n'ụbọchị Frịde. Ọ rụtụ aka maka ọtụtụ ihe na-echere gọọmentị Naijirịa aka mgba. Lee ka ya bụ mkparịta ụka siri gaa. Buhari zara sị, "" Kedụ etu ị ga-esi gaa ụlọọrụ ndị uweojii, gbuo ndị uweojii, gbaa ya ọkụ ma zuru etgbe ha, Kedụ ihe ndị ahụ bu n'obi?"" Ọ gara n'ihu sị, "" Enweghi etu gọọmentị ga-esi gbachị nkịtị."" Mgbe ajụrụ ya na ọ ga-eji ọkụ menyụọ ọkụ, ọ zara sị, ""Eee, anyị ga-eme karịa nke ahụ, anyị ga-ejide ha, kpee ha ikpe, gbaa ha n'anwụ ma tụọ ha nga ka ndị mmadụ mara na onye kpara agwa ọjụọ ka erite ụgwọ ọrụ ya"". O kwuru maka Endsars were sị dịka gọvanọ mbu Legọs steeti zụtara ụgbọala ga-enyere ndi Legọs aka kama oge Endsars ndị mmadụ gbara ya ọkụ. O kwuru sị, "" mgbe Gọvanọ na-achị Legos steeti biara gosi m ụgbọala ndị a agbara ọkụ, a gwaram ya ka ndị Legọs were ụkwụ ha na-aga n'ihi na gọọmentị enweghị ego ha ji azụta ụgbọala narị abụọ ọzọ"". Buhari zara sị, ""Ọ bụghị eziokwu, gaa jụọ gọvanọ Sokoto, Zamfara na Kastina etu ndị nchekwa sị anyụ ndị omekome a ịkpakụ, kama Naijirịa buru ibu ma nwee ọtụtụ ọhịa"". A chọrọ ka ndị Naijirịa cheta etu ihe di tupu ọ abata na etu ihe di ugbu a. Tupu anyị abata, Naijirịa na-emepụta mmanụ agbidi nde abụọ na otu ụma kama ndị omekome bidoro ịwakpo igwe mmanụ agbidi nke mere ka mmanụ agbidi Naijirịa na-emepụta gbadaa ruo nani iko barrel puku narị ise. Tupu anyị abata mmanụ agbidi bụ otu narị dola ka a na-ere ya kama ọmechakwara gbadaa. Ka ndị Naijirịa tule ihe ndị a. O kwuru sị, "" Ekwenyere m na gọọmentị a na-eme nke ọma na-agbanyeghị"". Onyeisiala Naijirịa kwuru na gọọmentị na-agbalị. Ọ kọwara na gọọmenti na-azụta ngwa ọgụ kama ọtụtụ oge, ọ na-ewe ogologo oge tupu o rute Naijirịa. Buharị kwuru sị,"" ọ bụghị nanị ịzụta ụgbọelu agha, na ụgbọala agha, ị ga-azụta spee pats ya, guziere ya ndị ga-eji ya lụo ọgụ tupu ịzịpu ha ịlu ọgụ. Jụọ ndị agha ịma etu ihe dị na 2015 na etu ihe dị ugba maka ngwa agha na ọzụzụ?""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57451316 +sports John Obi Mikel esuola ya kpọm! 'A laala m o' "Ọgbabọọlụ a ma ama bụ John Mikel Nchekwube Obi edepụtala hooha na ya achịsala ọwa n'egwu bọọlụ Naijiria. O buru ụzọ kwupụtara nke a na Tọọzde (18/7/2019) n'igwe okwu Instagram ya kerele otu egwu bọọlụ Naijiria maka inye ya ohere igosi nka ya na mba ụwa. ""Dịka m gbarala afọ iri atọ na-abụọ, oge eruola ila ezumike ịgbara otu egwu bọọlụ ala anyị ma nye ndị na-eto eto ndị kpara ike were nwetara ọla nchara n'asompi Afcon 2019 ohere iwere oche."" O kelekwara ụmụ Naijiria maka nkwado ha nyere ya. John Mikel Obi, onye ndu otu Super Eagles nke Naịjirịa gwaburu BBC na Africa Cup Of Nations (AFCON) a bụ nke ikpeazụ ya. O kwukwara na o nwereike ịbụ oge ikpeazụ ọ ga-agbara Naịjirịa bọọlụ. ""Afọ iri na atọ ezuola m, enwetela m nturuugo dị iche iche, oge eruola mgbe ndị ọzọ ga-eji gaa n'ihu"" ka o kwuru. Dịka ọ na-awụsa ọwa na Naịjiria, lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ya. Mikel Obi na ọrụ ya dịka ọgbaa bọọlụ Mikel Obi bụ onye Anambara steeti a mụrụ na Jọs malitere ịgba bọọlụ mgbe ọ dị afọ 12 na Pepsi Academy. E mechara họrọ ya na Plateau United tupu o bido ịgbara Naịjirịa bọọlụ, site n'ịga asọmpi Fédération Internationale de Football Association (FIFA) nke U-17 na Fịnland. Klọb mbụ ọ gbaara bọọlụ bụ Lyn Oslo dị na mba Norway; Manchester United na Chelsea mechara zọọ ya ụzọ oge ha chọrọ igo ya, nke gburu oge site na 2005 ruo 2006, mgbe Chelsea mezuru iwu ma zụrụ ya. Ebe ndị ọzọ ọ gbara gụnyere Tianjin TEDA, Middlesborough na Trabzonspor (bụ ebe ọ nọ ugbua). Obi bidoro ịgbara Super Eagles bọọlụ kemgbe afọ 2006. Nturugo ndị oritere Ka ọ na-agbara Chelsea bọolụ, Obi ritere ọtụtụ nturuugo ma bulie ọtụtụ iko. Olga Diyachenko bụ aha enyi nwaanyị Mikel, mụrụ ụmụejima nwaanyị n'afọ 2015. Dịka ọ dị ugbua a na-anụ kepu kepu na ha na-akwado ịlụ onwe ha. Nwaada Diyachenko bụ onye mba Rọshịa. Ihe ọzọ mere Mikel Obi N'afọ 2018, mgbe otu Super Eagles nọ na Rọshịa, akụkọ pụtara na a tọghapụla nna Mikel. Mikel wee zite ozi na ha atọhapụla ya: Ndị ntọ tọrọburu ya n'ụlọ ya na Jos ebe ọ na-elekọta ụlọọrụ ụgbọ njem ya. Ndị ntọ ahụ nara ihe ruru nde dọla iri abụọ na anọ mana ndị uweojii gbapụtara ya. Nna ya bụ Michael Obi ebe aha nne ya bụ Irosu Obi. Cheta na a tọrọla Nna Mikel mbụ n'afọ 2011 mgbe ọ na-agbara Chelsea bọọlụ." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48906232 +business "International Women's Day: ""Na mbụ di m ekweghị ka m na-akwọ ụgbọala ọha"" - Amaka Nwobodo" Amaka Nwobodo bụ nwaanyị na-akwọ ụgbọala ọha na Lagos. Ọ kọrọ BBC etu ya si maliere ịrụ ọrụ a na ihe ọ na-afụ dịka nwaanyị nọ n'etiti ọtụtụ ụmụnwoke akwọ ụgbọala ọha. O jikwa ohere wee gbaa ụmụnwaanyị ume na o nweghị dị njọ n'ịgba mbọ ma gbakarịa ụmụnwoke makana ịbụ nwaanyị abụghị ọghọm kama ọ bụ nnukwu uru. Akụkọ a na-abịa dịka a na-eme ncheta ụmụnwaanyị nke bekee kpọrọ International women's day taa na mba ụwa niile. https://www.bbc.com/igbo/afirika-56312395 +health Madagascar Cure: Ntule ọgwụ ọbụla tupu enye ya ndị mmadụ dị mma - Dọkịta Bekee "Otu dọkịta a na-akpọ McGinger Ibeneme ekwuola ka ọ ha ya gbasara mgbọrọgwụ mba Madagascar nke Naịjirịa zụtara maka iji gwọ ọrịa Covid-19. O kwuru nke a dịka akụkọ pụtara na-ekwu na gọọmentị Naịjirịa azụtala ụfọdụ ọgwụ a ""iji tulee ya ọfụma"" tupu ha enye ndị mmadụ. McGinger gwara BBC n'ekwentị na ""Coronavirus anyụọla mba ụwa ịkpakwụ, anyị chọrọ ka ya bụ ọrịa laa ya mere m ji akwado ntule ọgwụ ọbụla"". ""N'uche m, ma Chloroquine ma nwanne ya bụ Hydroxychloroquine kwesiri ka etule ya tupu enya ya ndị mmadụ"". Onyeisiala mba Madagascar bụ Andry Rajoelina kwuputara na ndị sayensi mba ya achọpụtala ọgwụgwọ ọrịa Covid-19 n'ọnwa Eprelu. Mba dị icheiche dịka Tanzania, Guniea Bissau, Senegal, Congo-Brazzaville azụtala ọgwụ a n'aka Madagascar. Ngalaba ahụike mba ụwa bụ WHO n'aha ịchafụ adọọla aka na ntị gbasara ya bụ ọgwụ ma kwuo ""mba Afrịka dịka mba ụwa niile kwesiri ịnweta ọgwụ enyochara ma hazie ọfụma maka ọgwụgwọ ọrịa a"". N'otu aka ahụ ọgbakọ ECOWAS agọrọla aka ha na ụkwụ ha gbasara ike ya bụ ọgwụ nwere n'ịgwọ Covid-19. Ọgbakọ mba Afrịka bụ AU n'ịchafụ gwakwara mba Madagascar ha wepụta ndekọ gosiri na ha enyochala ọgwụ a ọfụma tupu ha anabata ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52623406 +sports Rangers FC Enugwu: gọmenti Enugwu enyela ezi na ụlọ Ifeanyi George nwụrụ anwụ 20m naira Otu egwu bọlụ Rangers nke Enugwu steeti emezuola nkwa ha kwere site na inye ezi na ụlọ Ifeanyi George bụbụ onye egwu bọlụ ha nwụrụ anwụ ọkpụrụkpụ ego 20 m naira. Ego ahụ bụ nrite ego insurance nke ndụ nwa amadị ahụ nwụrụ n'ihe mberede nke ụgbọala n'ọnwa March afọ a. Nwanne ya nwoke George Onwụbiko natara ya bụ asambodo cheki n'aha ezinụlọ ha. Commisioner nke egwuregwu na ndị ntorobia n'Enugwu bụ Manfred Nzekwe bụ onye nyefere ha ya bụ ego na aha Gọvanọ Ifeanyi Igwuanyi. Onye nchikọta Rangers bụ mazi Davidson owumi buru ụkpọ ekene nye gọmenti Enugwu maka ya omalicha ya bụ atụmatụ insurance ha wepụtara. Ndị otu egwu bọọlụ Rangers nke Enugwu steeti ekwuputala na ha ga-enye ezinụlọ Ifeanyi George nwụrụ anwụ ego dị nde naira iri abụọ (N20 million) iji tie ha aka n'obi. Nke a bụ ego adịghị ama ama nke Bekee kpọrọ 'insurance' bụ nke a na-ewepụ n'ụgwọ ọnwa mmadụ kwa ọnwa oge ọ dị ndụ. Cheta na Davidson Owumi bụ onyeisi Rabgers kwuru na ha ga enyefe ya bụ ego na aka ezinụlọ Ifeanyi George ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Julaị. Ifeanyi George bụ nwa afọ Rangers FC Enugwu nwuru n'ihe mberede okporouzo na ụbọchi iri abụọ na abụọ nke ọnwa Maachị afọ 2020 oge o si Enugwu na-aga Lagos. Cheta na onye nchịkọta ndị Rangers bụ Davison Owumi gwaburu BBC na ndi egwubọọlụ niile aha ha dị n'akwụkwọ ndị 'Nigeria Professional Football League' nwere ezigbo ihe nrite ma ọ bụru na ihe mee ha. Owumi kwuru na steeti kwunyere ụgwọ n'isi ụmụ Rangers n'ụlọọrụ Premiere Brokers Insurance maka ihe ntụmadị ọbụla rụọ afọ 2021. https://www.bbc.com/igbo/afirika-53325459 +politics Ụlọọrụ EFCC atọhapụla Willie Obiano "Ụlọọrụ Economic and Financial Crime Commission, EFCC, ekwuola na ha atọhapụla Willie Obiano bụbu Gọvanọ Anambra steeti agbanyeghị na ha ka na-eme nnyocha. Ọṅụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwujaren sị na ya agaghị ekwụ ma ha napụrụ ya akwụkwọ ikike njem ya. Oge gara aga, Ụlọọrụ ahụ na ahụ maka mgbochị mpụ na nrụrụaka na Naịjirịa kwuru n'ụbọchị Mọnde na ha enyochapụtala otu onye ọrụ ha ha na-ebo ebubo na ọ bụ ya sere ma kesaa ihe onyonyo aka chibụrụ Anambra steeti bụ Willie Obiano dịka ọ nọ n'aka ha. Ụlọọrụ EFCC kwuru na ha akwadoghị agwa a onye ọrụ ha kpara ma kwuo na o soghị na usoro ọrụ ha. Ha kwukwara na ha ga-enye onye ahụ ntaramahụhụ dịrị ya agbanyeghị na ha ekwupụtaghị ihe ntaramahụhụ a gụnyere. Cheta na ebe ngwụcha izu gara aga otu ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia nke gosiri Obiano ebe ya na otu nwoke nọ n'ụlọọrụ ndị EFCC. Kepụkepụ pụtara ihe n'ụtụtụ Fraịde na-akọwa na atọhapụla onye bụbu Gọvanọ Anambra steeti nke ụlọọrụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) jidere n'abalị Tọọzde. Wilson Uwajaren bụ ọnụ na-ekwuru ndị ụlọọrụ a sị na ""akụkọ ahụ na-ekwu na EFCC atọhapụla Obiano bụ akụkọ ụgha. Ọ ka nọ na-aka anyị rụrọ mgbe anyị mechere nchọpụta"". BBC Igbo juru Wilson ka ọ ma ihe a na-ebo Obiano ha nwụchiri ebubo maka ya. Ọ zara na ọbụghị ihe ya ga-aza ozugbo, mana ""tupu anyị ejide mmadụ, ọ ga-enweriri ihe onye ahụ mere. Mana ihe m ga-agwa unu ugbua bụ na Obiano ka nọ na-aka anyị maka nnyocha"". Ọ sị na Obianọ ma na ya nọ na-akwụkwọ ndị EFCC na-achọ achọ were chọọ ịgbapụ. O kwuru na ha esila Legọs steeti buga ya Abuja. Wilson sịkwa na ya amatabeghị mgbe a ga-akpụpụ ya ụlọikpe, na ndị ga-ama nke ahụ bụ ndị ngalaba ""operations"" ha, bụ ndị jidere ya. Ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), nwụchiri onye bụbu Gọvanọ Anambra steeti n'ọdọụgbọelụ Murtala Mohammed International Airport dị na Legọs steetị ụnyaahụ bụ Tọọzde ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Maachị 2022. Nke a mere ka ọ nyefechere ọchịchị Anambra steeti n'aka Gọvanọ Charles Soludo ụnyaahụ, na-emezị njem nke a sị na ọ bụ mba ofesi ka o zubere ịga tupu anwụchie ya. Akụkọ kwuru na Obiano na-aga Houston, Texas mgbe a nwụchiri ya n'ọdọụgbọelụ ahụ. Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwajaren bụ onye gwara BBC nke a, sị na Obianọ nọ n'ụlọọrụ ha dị na Legọs ugbua. EFCC kwuru: ""ọteela anyị ji arọ ya anya mana iwu nchekwa ndị nọ n'ọchịchị nke Bekee kpọrọ ""immunity"" ekweghị anyị ruo ya nso. Mana ya bụ ""immunity"" gwuru ụnyaahụ, nke mere anyị jiri nwee ohere ịwụchi ya"". O dobeghị anya ihe mere anya EFCC jiri nọrọ n'isi Obiano maka amabeghị ihe a na-ebo ya. Anyị ka ga-ewetere gị akụkọ a n'uju ka ọ na-apụta. Obiano bụ aka chiburu Anambra steeti site n'afọ 2014 ruo 2022 bụ onye Aguleri nke dị n'okpuruọchịchị Anambra North. O ji ọkọlọtọ ndị All Progressive Grand Alliance, APGA, were chia Anambra steeti Afọ asatọ. Ọ gara akwụkwọ na Mahadum University of Lagos bụ ebe ọ nwetere asambodo na Accountancy na njere nke ""masters"" na Business Admin n'afọ 1979. Aha nwunye ya bụ Ebelechukwu Obiano Lekwa Gọvanọ ndị ọzọ EFCC nwụchigoro Kemgbe Nịjirịa banyere repụblik nke anọ na 1999 ruo ugbua, EFCC anwuchiela gọvanọ iri atọ (30) maka ebubo nrụrụaka na mpụ. Willie Obiano mere ya onye nke iri atọ n'otu. EFCC nwuchiri ya ụbọchị Tọzde, ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Maachi 2022. Ụbọchị anwụchiri ya bụ ụbọchị ọ nyefere ọchịchị n'aka Gọvanọ ọhụrụ Anambra steeti bụ Charles Soludo. EFCC sị na ọ teela ha rọwara ya anya, mana ha enwghị ike ijide ya maka ""immunity"" ya. James Ibori bụbu Gọvanọ Delter steeti (1999 - 2007) rachara afọ iri na atọ (13) na mkpọrọ maka ebubo $77m o zuru mgbe ọ na-achị steeti ahụ. James kwetere na ya kpara nkata ezu ego ma bufee ya ofesi n'ụlọikpe South Crown n'UK. Ọ gbara ọsọ na Naịjirịa, ha jide ya na Dubia 2010 buga ya UK. Rochas Okorocha chịrị Imo steetị n'afọ 2011 ruo 2019 nọ n'aka EFFC na 13 Apreelu 2021 mgbe ha wuchiri ya Unity House office dị na Garki, Abuja. Ha boro ya ebubo ibuba ego nakwa imefu ego steeti Imo. A wụchiri Okorocha na Febụwarị 2021 mgbe gọomentị Imo steeti boro ya ebubo maka ụlọ nwinye ya ọ mepere. A tụrụ Oji Uzo Kanu mkpọrọ afọ iri na abụọ (12) maka ebubo ibuba ego steeti. Ụlọikpe mara ya na mmadụ abụọ ọzọ ikpe ibuba ego dị ijeri asaa na ụma (N7.65) mgbe ha nọ n'ọchịchị malite n'afọ 1999 -2007. Gabriel Suswam nke Benue steeti Audu Abubakar nke Kogi steeti Abdullahi Adamu nke Nasarawa steeti Aliyu Akwe Doma nke Nasarawa steeti Joshua Dariye nke Plateau steeti Jonah Jang nke Plateau steeti James Bala Ngilari nke Adamawa steeti Murtala Nyako nke Adamawa steeti Ali Modu Sheriff nke Borno steeti Danjuma Goje nke Gombe steeti Jolly Nyame nke Taraba steeti Sule Lamido nke Jigawa steeti Aliyu Wammako nke Sokoto steeti Abdulaziz Yari nke Zamfara steeti Theodore Orji nke Abia steeti Chimaroke Nnamani nke Enugu steeti Sullivan Chime nke Enugu steeti Ikedi Ohakim nke Imo steeti Godswill Akpabi nke Akwa Ibom steeti Diepreye Alamieyeseigha nke Bayelsa steeti Timipre Sylva nke Bayelsa steeti Lucky Igbinedion nke Edo steeti Olugbenga Daniel nke Ogun steeti Adebayo Alao-Akala nke Oyo steeti Rashidi Ladoja nke Oyo steeti" https://www.bbc.com/igbo/afirika-60790921 +business Ogbambọ: Lee nwaanyị bụ ọkaibe n'ịrụ ụgbọala "Ifeyinwa Okonkwo e ji ""Madam Benz"" mara ekwuola ka o si malite irụ ọrụ ụgbọala. O kwuru na ọ rụọla ọrụ a ruo afọ iri abụọ. Okonkwo kwuru na iru ụgbọala aghịaghị ahụ nke bụ na ụmụnwaanyị nwereike iji ya mere aka ọrụ. O kwuru na ọ ga-achọ ka ụmụ ya banye ọrụ a. Kirie ihe o kwuru n'uju ebe a." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58242344 +entertainment Burna Boy ọ ga-abụ onye Naịjiria mbụ ga-erite Grammy? "Emume Grammy nke iri isii na abụọ ehibere n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Jenụarị na-ebiri ọkụ na Los Angeles dị na mba Amerịka. Ụmụ Naịjirịa nọ n'elu twitter na-egosi obi anụrị ha na 'Burna Boy' nke Naịjirịa so na ndị nwereike inweta ya bụ nturugo. Ụfọdụ n'ime ha na-ekwu ihe ha ga-eme ma ọ bụrụ na o merie . @CalebChom na-ekwu ego ọ ga-enye maọbụrụ na Burna mabute Grammy @FreedomOghenero na-ekwu na obi siri ya ike na Burna ga-amabute ihe nrite a. Cheta na Burna Boy nke Naịjirịa so na ndị nwereike inweta ntụruugo kachasị n'egwu bụ Grammy. E debanyere ọbaegwu ya ọ kpọrọ 'African Giant' n'ogogo ndị nwereike inweta 'ọba egwu kachasị mma n'ụwa' nke bụ 'Best World Music Album na Bekee'. Nke a ga-eme ya mbụ Burna Boy ezigbo aha ya bụ Damini Ogulu, na-abanye na ndị nwereike irite nturuugo Grammy a. Mana ọ bụghị ya bụ onye Naịjirịa mbụ na-enweta ohere a; ndị dịka King Sunny Ade, Fela Kuti, Femi Kuti na ndị ọzọ. 'Soshal midia bill' Gị na-eji soshal midia achọ ndị mmadụ okwu, ị nwereike ịbanye na nsogbu ma e tinye iwu a. Ị chetara iwu megidere okwu akpọmasị ndị ụlọomeiwu ukwu tiputara n'izu gara aga nke a sị na ikpe ya bụ ikpe ọnwụ? E bufekwaala ya ngụpụta nke abụọ ugbua. Obiano na-akasi ndị ahịa Ọchanja obi Aka na-achị Anambara steeti bụ Willie Obiano etiela ndị ọkụ gbara ihe ha n'Ọchanja metụtara aka n'obi ma kwuo na enweghị ụdịrị ego ọ sọrọ ya bụrụ, nwereike ịkpọghachite ndị nwụrụ anwụ. Obiano kwuru nke a ka o du ụfọdụ ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'Anambara steeti gaa ekpere maka akwamozu nne na nna nwa ọkụ ahịa Ọchanja ahụ gbagburu. Jose Mourinho ga-anọ Tottenham ruo 2020-23 Jose Mourinho ndị Tottenham ka were n'ọrụ, ga-anọ ebe ahụ ruo afọ 2022 na 2023 ma ọ bụrụ na o metaghị ihe e ji chụọ ya. Mourinho na onwe ya kwuru na ọ bụ ụdịrị ndị ọgbabọolụ nọ n'otu ahụ mere akpịrị ogologo isonye otu a. Akụkọ mere ugbua bụ na Jose Mourinho abụrụla onye nchịkọta otu egwuregwu Tottenham Hotspur dịka a chụchara Mauricio Pochettino. Mourinho bụbu onye nchịkọta Manchester United na Chelsea tinyereaka n'akwụkwọ ịnọ n'ọkwa na ngwụcha afọ 2022 ruo 2023. Mourinho sị na ụdịrị ndị ọgba bọọlụ Tottenham nwere na-enye ya obi aṅụrị nke ukwuu. Onyeisioche ndị Tottenham bụ Daniel Levy sị "" N'ime Jose anyị nwere onye so n'otu ndị nchịkọta kachasị mma na bọọlụ"" Cheta na Tottenham chụrụ Mauricio Pochettino n'ọrụ agbanyeghi na o du ha ruo agba nke ikpeazụ asọmpi champịọns league n'afọ gara aga. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya Harry Kane bụ onye ndu ndị Tottenham sị na ọ na-abatara Mourinho n'otu ha Matt sị ka a na-atụ anya Bale ịbịa Tottenham ugbua Josephine ugwu atụrụla ugwu Nwada Josephine Ugwu turuugo pụrụiche n'aka onyeisala Buhari maka ego ndị mmadụ furu efu ọ na-eweghachite azụ n'ọdọụgbọelu dị ịche iche na Naịjirịa. Nwaanyị na-arụ ọrụ ihicha ụlọ weghachịrị ọtụtụ nde maịra ego. N'ofesi Mba Izrel akwala mgbọ na mba n'ọtụtụ ebe na mba Siria megide gọọmentị Siria nakwa ndịagha Ịran. Ndịagha Izrel sị na nke a bụ na nzaghachị ọtụtụ ogbunigwe ndịagha Iran gbara n'Izrel. Nkeji ehihie Buhari sị ka ehiwe ụlọikpe pụrụiche maka mpụ Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọkuola ndị ụlọomeoiwu ka ha gbapụ ya ọsọ n'itinye iwu ga-ehiwe ụlọikpe ga-elebanya na mpụ ndị pụrụiche. Ọ kpọrọ oku a n'ọgbakọ e mere iji belata nrụrụaka n'etiti ndị na-arụrụ ọha ọrụ bụ ebe ọ rịọrọ ndị ọkaikpe ka ha nabata atụmatụ a. Ụkọchukwu a sị wakporo nwaanyị n'ike Ndị uweojii Enugwu steeti agbaala otu ụkọchukwu n'anwụ n'ihi ebubo ịwakpo otu nwaanyị n'ike nakwa ịkwọ ọgwụ ego. Komishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ahmed Abdur-rahman kwupụtara nke mgbe ọ na-agba mmadụ iri atọ na isii ndị ọzọ n'anwụ maka mpụ dị iche iche. Ndịagha mba Amerịka abụọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu helikọpta mere n'Afghanistan n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Nọvemba. A ka na-enyocha ihe kpatara nke a mana ndị oyi ndụ egwu kwuru na ha gbaturu ụgbọelu helikọpta ndị Amerịka na mpaghara Logar. Nkeji Ihe nkiri" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50485055 +politics Anambra governorship election debate 2021: Ihe Ozigbo, Okonkwo Uba, Uzoh, Maduka kwuru ha ga-emere ndị Anambra steeti "Ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa gọvanọ Anambara steeti na ntuliaka ga-eme n'abalị isii nke ọnwa Novemba, afọ 2021 gụnyere Valentine Ozigbo, Ifeanyi Uba, Obinna Uzo, Godwin Mmaduka na Obiora Okonkwo. Lee ihe ndị ha kwuru gbasara ndakpọ nchekwa, mwulite akụnaụba ndị ntorobia na ihe ndị ọzọ: Ndị Anambara ekwela ọ dị ha ka oge Massob sị emela Census - Ifeanyị Uba, YPP Onye ga-efe ọkọlọtọ otu pati YPP bụ Ifeanyi Uba kwuru na ngwangwa ya banyere n'ọchịchị na ya ga-eme ka e jiri 'biometric system'nwee ngụkọ mmadụ niile nọ na steeti ahụ na a na-enweta ozi ma onye ọbụla daa iwu n'obodo. ""Achọrọ m ka Anambara bụrụ steeti mbụ ga-etinye biometric system."" Ifeanyi Uba kwukwara sị, ""Anyị ga-akpọkọba ndị ntoria maka ọrụ."" ""Anyị bịara ka anyị na ndị Anambara dozie obodo."" N'okwu ndị sịrị na a gaghị eme ntuliaka, Uba dọrọ aka n na ndị ka Igbo ghara ikwe ka ọ dị ha ka ọ dị ha oge Massob kwuru na ndị Igbo agaghị eme census,""e meghị ya.Ugbua e kee oke, nke ndị Igbo na-epe mpe karịa."" Obinna Uzor nke otu SDP kwuru na ""Ị kpọgasia ndị nwe obodo, a kpaa ụmụ ihe a amara ka a ga-esi nye aka"" n'okwu ndakpọ nchekwa n'Anambara steeti. ""Lee etu a ga-esi nye ndị uweojii ọzuzụ na enyemaka eji arụ ọrụ, enyere ha  aka."" Ọ gara n'ihu sị ""Anyị bụ ndị na-agba mbọ, enyere ụmụ anyị aka ka ha nwee ihe ha na-eme."" ""N'ime obodo na-achị ebe dị icheiche enyere ha aka."" Obiora Okonkwo nke Zenith Labour Party kwuru na ""Anyị ma ihe anyị ga-eme ozugbo ahaziri okwu nchekwa."" ""M ga akpọ ụmụ Igbo gwa ha okwu ma rịọ ha etu nna si arịọ nwa ka ha butuo obi."" N'agụmakwụkwọ, Okonkwo kwuru na ya ga-enye ohere agụmakwụkwọ n'efu bido na ọtakara rue Pramarị. Okonkwo kwukwara sị, ""Ndị ọga bụ ndị ga-achị Anambara steeti ọbụghị ndị Boị."" ""Ị lee anya n'elu ya nsogbu nchekwa dị n'ụdị n'ụdị."" Aga m etinye ọnọdụ gbatata n'okwu nchekwa obodo- Ozigbo Valentine Ozigbo bụ onye na-efe ọkọlọtọ PDP sịrị: ""A ga-akpọ ọnọdụ gbatagbata n'ihe gbasara idozi obodo nke gụnyere ụzọ na nchekwa."" O kwuru na ya ga-enye ụmụnwaanyị ohere inwe ọkwa n'ọchịchị ya. ""Ụmụnwaanyị chee aka ghọrọ m n'ihi na o nwebeghi ihe ha ga-ahụ dị ka m ma m banye ọchịchị."" ""A ga-agba mbọ jiri teknụzụ belata mmefu, nwere ndị aka ha kwụ ọtụ tinye n'ọchịchị."" Abịara m idozi obodo, akpatala m ego- Godwin Maduka Godwin Maduka nke Accord Party kwuru na ""Ihe m bịara bụ imezi obodo, ọ bụghị ịkpata akpata"". Maduka kwuru na onye ejighị ego ekwesịghị ịzọ ọkwa gọvanọ sị, ""O nwe onye ji ụgwọ ọ gaghị a bụ Gọvanọ.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-59081515 +entertainment Christmas: Ekeresimesi na-eku ebe niile ka ụgụrụ N'agbanyeghi na ọtụtụ ndị mmadụ na-eti mkpụ ihe isi ike, Ekeresimesi afọ a na-akpọtụ ebe niile. https://www.bbc.com/igbo/afirika-46667790 +entertainment Actors Guild of Nigeria: Ime Sịnetọ Abbo 'patron' dịka ibute nsị n'ime ụlọ - Ụmụnwaanyị Nollywood Ụfọdụ ndị na-eme ihe nkiri ọkachasị ụmụnwaanyị agbarụọla ihu etu ndịisi otu jikọrọ ndị na-eme ihe nkiri bụ Actors Guild of Nigeria (AGN) ji mee Sịnetọ Elisha Abbo papa ukwu ha. Nke a dị n'ihe onyonyo nakwa ihe ha depụtara n'akara soshal midia ha bụ ebe ha gbarụrụ ihe maka nke a. Hilda Dokubo gọsịpụtara iwe site n'ihe onyonyo dị n'akara twitter nke mere BBC Igbo ji gbaa ya ajụjụọnụ iji maka ihe bụ iwe ya. Dokubo gwara BBC sị na sịnetọ Abbo etozughi oke ịnata ọkwa ahụ maka agwa ọjọọ ọ kpasoro otu nwaanyị n'Abuja n'afọ 2019. Ọ sị na ọ bụ otu sịnetọ a bụ onye tiri nwaagbọghọ ihe n'ụlọahịa dị n'Abuja na-arịọghị mgbaghara n'ụzọ kwesịrị. Ọ gara n'ihu kwuo na ime Sịnetọ Abbo Papa ukwu n'AGN dịka ibute nsị n'ime ụlọ. Hilda sị na nke ka nke bụ na ndịisi ha emeghi ka ọtụtụ n'ime mara tupu e nye sịnetọ Abbo ọkwa ahụ. N'otu aka ahụ nwaanyị ọzọ na-eme ihe nkiri bụ Kate Henshaw tinyere ọnụ ya n'okwu a site n'akara Twitter ya. O kwuru na Elisha Abbo etorughi ịbụ papa ukwu n'otu AGN, ka ọ ghara ịma ụmụnwaanyị akantị. Mana onyeisi otu AGN bụ Emeka Rollas zaghachịrị ndị a site n'ajụjụọnụ ụlọọrụ ntaakụkọ Pulsetv gbara ya. Emeka sị na Abbo arịọla mgbaghara maka ịma nwaanyị ụra, na ọ dịghị ndị AGN n'aka ikpe ya ikpe. Ọ gara n'ihu kwuo na odoghi ya anya ma Hilda na Kate ha so n'otu AGN, na ọ ga-eleba anya n'akwụkwọ ka ọ mara https://www.bbc.com/igbo/afirika-51935658 +business Computer village protest: Anyị achoghị nne ukwu na nna ukwu n'ahịa anyị Ndị na-azụ ahịa na Kọmpụta vileji nke Legọs akpọọla ekwo nkụ na ha agaghị anabata Iyalọja na Babaloja bụ nke achọrọ ịtụkwasị ha n'isi dịka omenala ndị Yoruba si dị. Onyeisi ndị otu ahịa ahụ bụ Ahmed Ojikutu bụ ndị kpọrọ onwe ha Allied Products Dealers Association of Nigeria (CAPDAN) kwuru nke a ụnyaahụ mgbe ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu. Ndị na-azụ ahịa mere ngagharịiwe n'ụbọchị Tuzde iji gosi iwe ha ma rịọ ndị Naịjirịa niile ka ha ekwela ka amanye ha mama ukwu na papa ukwu n'ime ahịa ha. Onye bụ Iyalọja? Iyalọja bụ nwaanyị onyeisi ahịa dịka ụmụnwaanyị ahịa siri họpụta. Dịka ọkammụta n'asụsụs Bisoye Elesin siri gwa BBC, ọ bụ Oba obodo ka o ruru ịhọpụta onye bụ Iyalọja. O kwuru na ọ bụ omenala ịhọpụta onye na-azụ ahịa ebe ahụ ma sorokwa kwalite ahịa ahụ. Elesin kwuru na ọ nwereike ọ gaghị enwe isi maọbụrụ na ahọpụta Iyalọja n'ahịa ebe e nwere ndị si n'agbụrụ dị icheiche. Taa bụ ụbọchị enwepụtara maka ịja ndị ọrụ ike n'ụwa gbaa gburugburu bụkwa ụbọchị ezumike ndị ọrụ niile na Naịjirịa Odeakwụkwọ Nigeria Labour Congress bụ Peter Ozo-Eson ji ohere a kpọọ oku ka amalite ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa opekatampe puku naịra iri atọ n'ọnwa Mee a. Onye nnọchite anya ụlọrụ Economic and Financial Crimes Commission arịọla ndị gọvanọ na-abata ọhụrụ na ndị ochie ha sepụ aka na ngarị na mpụ na mmalite ọrụ ahụrụ ha. Ibrahim Magu bụ onye kwuru nke a n'ọkpakọ ndị gọvanọ ọhụrụ na ndị ochie sị na mpụ na ntọ bụ ihe kacha echere gọọmenti a aka mgba. N'ofesi, Onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump ekwuola na gọọmentị ya ga-etinye aha ndị Moslem Brotherhood nke Ijipt dị ka ndị Omekataraihepụụjọ. Trump kwuru nke a ụnyahụ mgbe onyeisi mba Ijipt bụ Abdel Fattah al-Sisi kpọtụrụ na obi ya bụ ebe ọ nọ kwuo na ọ ga-amachi ndị otu ahụ mmekọ gbasara njem na akụnaụba. N'egwuruegwu, Ajax ji otu ọkpụ goolu merie Tottenham n'asọmpi Uefa Champion's league ụnyaahụ. Goolu a si n'aka Donny van de Beek emeela ka Ajax manye otu ụkwụ n'agba ikpeazụ nke asọmpi a. https://www.bbc.com/igbo/media-48080631 +sports Ronald Koeman: Ọ ga-ebulinwu Barcelona elu ọzọ? Ronald Bignan Koeman na-achịkọta otu egwuregwu mba Nedalandị anọchiela Quique Setien dịka onye nchịkọta Barcelona. Cheta na a chụrụ Setien dịka otu Bayern Munich ji ọkpụ goolu asatọ asatara naanị abụọ gbaara Barcelona ụgbọ nwamkpi n'abali ole na ole gara aga n'asọmpi Champions League nke afọ 2020. Josep Bartomeu bụ onyeisi otu egwuregwu ahụ kwuru na ọ bụrụ na ihe niile gaa n'anya ya, na Koeman ga-anọ n'ọkwa onye nchịkọta ahụ ruo afọ 2021. Ị chọrọ ịma onye Koeman a bụ? Lee ihe anyị chọpụtara maka ya: Ị hụla na o nyerela ndị ọ gbaara bọọlụ aka ibute iko mgbe ọ chịkọtara ha, ọ dị gị ka ọ ga-eme ọfụma na Barcelona ma ọ bụrụ na ọ gaa ịchị ha? https://www.bbc.com/igbo/afirika-53797664 +entertainment Chioma Davido ewepụchaala ọtụtụ foto Davido n'igwe Instagram ya "Ọ bụ etu a ka BBC Igbo si wee hụ ya mgbe ha gara n'igwe Instagram Chioma enyi nwaanyị Davido. A hụrụ na nwaada Igbo a e ji eme ọnụ ewepụchala ọtụtụ foto Davido n'igwe Instagram ya dịka anyị hụrụ ebe a. Naanị foto ọ hapụrụ n'akara ya bụ foto ebe Davido ku nwa ha nwoke bụ Ifeanyi nakwa ụfọdụ ndi ọzọ ha sere dịka ha nọ n'ebe oriri. Nke na-abịa dịka kepkepu fegharịrị na-ebo ebubo na Davido na-ayị Mya Yafai bụbu enyinwaanyị otiegwu rap mba Amerika a ma dịka 'Young Ma.' Ị ma ihe mere ndị mmadụ ji hụ Chioma n'anya?Chioma Avril Rowland bụ onye ndị mmadụ matara site na ọyị ya na otiegwu a ma ama bụ Davido na-ayị. Ha abụọ malitere ịyị onwe ha mgbe ha zutere na Mahadum mana ugbua, ọ fọziri obere ka ha bụrụ di na nwunye. N'afọ 2019, Davido depụtara na ọ gaala hụ ezinaụlọ Chiome nke Bekee kpọrọ ""Introduction"". Mana ewezụga Davido, ị ma na o nwere ụfọdụ ihe ị maghị maka Chioma?Lee ya ebe a 1. Chioma bụ osinri kajara akaja nke mere na ""Chef chi"" a na-etu ya abụghị na nkịtị. Ị chọọ ịma maọbụ eziokwu gaa na peeji Instagram ya @Thechefchi 2. Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Babcock nke dị n'Ogun steeti ebe ọ gụrụ ""Economics"" Ọ bụkwa ebe ahu ka o zutere Davido na-agụ ""Music"" n'otu mahadum ahụ kwa. 3. Chioma, nne ya na nna ya nakwa ụmụnwanne ya bụ ndị Imo steeti. Ha ncha bụkwa ndị ụka ""Seventh Day Adventist"" 4 O nweghi onye ma oke ihe maka ezinaụlọ ya mana o nwere otu nwanne ya nwaanyị a na-akpọ Jennifer na-akwa akwa. 5. Chioma mụọrọ Davido nwa nke atọ ya na nwa nwoke mbụ n'ọnwa Ọktoba afọ 2019. Ha gụrụ nwa ahụ David Ifeanyi Adeleke. Nke a mere ka ufọdụ mmadụ na-akpọ Chioma ""Mama Ifeanyi"". 6. N'ụbọchị 27 nke ọnwa Maaachị afọ 2020, Davido kwuru na Chioma butere ọrịa Coronavirus. Akụkọ a pụtara ihe dịka ha si njem mba Amerịka bata Naịjirịa. Mana n'ụbọchị 19 nke ọnwa Eprelu, Davido depụtakwara na ọ gbakeela n'ọrịa ahụ." https://www.bbc.com/igbo/media-52450026 +business Interally generated Revenue: Lekwa steeti kacha akpata ego na dị owu na-asa na Naịjirịa N'akwụkwọ ndị National Bureau of Statistics (NBS) biputara e gosila steeti bụ ide ego na ngwụcha afọ 2019. Na ya bụ akwụkwọ ha biputara n'ụbọchị Frịade, Legọs steeti bụ ndị mbụ n'ịgbata ego n'onwe ha. Ha ji ihe ruru ijeri Naịra narị atọ na iri itoolu na asatọ, nde narị asaa, iri atọ na abụọ, puku narị abụọ iri anọ na isii, narị anọ iri itoolu na atọ na kobo iri atọ na asatọ (N398,732,246,493.39) were bụrụ ndị mbụ (1). River steeti ji otu narị ijere, na iri anọ, narị nde atọ na iri itoolu na asatọ, na puku asaa na iri anọ na anọ, na narị atọ na abụọ, na kobo iri asaa (N140, 398, 744, 302.70) were gbaa ndị nke abụọ (2). Abuja jiri ijeri iri asaa na anọ, nde narị ise na iri isii na anọ, otu narị puku na iri asatọ, narị asatọ na iri atọ na ise, na kobo iri atọ na otu (N74,564,180,835.31) were sowe ha dịka ndị atọ. Steeti mbụ n'alaigbo bịawara nso bụ Enugwu steeti bụ ndị ji ijeri iri atọ na otu, nde iri isii na itoolu, puku narị anọ na iri isii na isii, na narị itoolu na iri na atọ (N31,069,466,913.00) were gbaa ndị nke itoolu (9). Anambra steeti were ijeri iri abụọ na isii, puku narị atọ iri isii na itoolu, otu puku na narị itollu na ise, narị asatọ na iri asatọ na abụọ, kobo iri asatọ na itoolu (N26,369,195,864.89) gbaa ndị nke iri na anọ (14). Imo ji ijeri Naịra iri na isii, nde iri itoolu na ise, puku narị abụọ iri itoolu na itoolu, narị irii na iri abụọ. kobo iri ise na itoolu (N16,095,299,620.59) agba ndị nke iri abụọ na abụọ (22). Abia steeti werezia ijeri Naịra iri na anọ, nde narị asaa na iri isii na itoolu, puku narị atọ na asaa, narị isii na iri ise na asatọ na kobo iri ise na ise (N14,769,307,658.56) gbaa ndị nke iri abụọ na anọ (24). Ebe Ebonyi steeti ji ijeri asaa, nde narị anọ iri ise na ise, puku narị abụọ iri itoolu na anọ, narị isii na iri asaa na isii na kobo iri ise na itoolu (N7,455,294,676.59) na agba ọnyụpa n'azụ ha dịka ndị iri atọ na isii (36). Ndị bu klasị n'isi n'ịkpatara onwe ha ego na Naịjrịa bụ ndị Taraba steeti bụ ndị nwetere ijeri Naịra isii na ụma. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52778091 +sports Real Madrid vs atlético Madrid: Bale ga-akwakọrọ ngwongwo ya laa China ka eziri ha onye bụ oke Diego Costa gosiri ihe ojiri bụrụ onye egwu ọpụrụiche ka onyere ọkpụ goolu anọ iji nyere Atletico Madrid aka tie ogbo ha bụ Real Madrid ezigbote ihe na obodo New York. Costa - bụ onye emechara chụpụ n'asọmpị ahụ - nọ n'isi ọkpụ asaa Atletico ji sị Real na ọ bụ ha bụ eze Madrid. Dani Carvajal nke Real Madrid natakwara akwụkwọ mee mee ka anya chawara ndị agba bọọlụ ọbara ọbara na ya bu asọmpị. Real chịtara sọsọ aja atọ mana nke ahụ agaghi ịkasị ha obi maka nke a bụ asọmpị atọ n'aghịrị ha ejighi mmeri laa. Nke a na-abịa na-azụ Bayern Munich na Arsenal gbara ọkpụ abụọ ọkpụ ọkpụ abụọ na-egwuregwu Gareth Bale nyere otu goolu. Okwu Gareth Bale banyere asọmpị a maka ọkwakọwala akpa ya na nkwado ịga otu egwuregwu Jiangsu Suning nke china. O nwere nkwekọrịta ịnọ afọ atọ ebe ahụ. Zinedine Zidane bụ onye nkuzi Real Madrid kwuburu na ọ ga-akara mmadụ niile mma ma nwaamadị a chọrọ ụzọ ya. Cheta na Bale bidoro gbawara ndị otu bọọlụ Real Madrid Bọọlu na 2013. Ndị otu bọọlụ Jiang Suning ga-akwu Gareth Bale otu nde Pounds kwa izu. Ihe nkiri a ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-49124342 +entertainment Nigerian Wedding Budget: Ihe ọ ga-ewe nwaanyị ihazi agbamakwụkwọ ya "Ị bụ nwaada na-akwado ịgba akwụkwọ? Akụkọ a bụ maka gị. Site n'oge ha dị obere, ọtụtụ ụmụnwaanyị nwere ebumnobi na 'nrọ' maka etu agbamakwụkwọ ha ga-adị. Mana mgbe ụfọdụ tolitere, ebumnobi ha ahụ na-agbanwe ma ghara ịdị ka ihe ha chọburu; ụfọdụ oge ọ bụrụ na ihe ha chọzịrị akala mma. Nke a na-eme ka ụmụnwaanyị, ọkachasị ndị na-achọghị ịkwụ ndị ọrụ ha bụ ihazi agbamakwụkwọ ụgwọ, jiri aka ha hazie usoro agbamakwụkwọ ha, ka ọ bụrụ okwu a kpụ n'ọnụ. Nke bụ eziokwu bụ na i nweghi ike ịsị ""lee ego ole agbamakwụkwọ m ga-eri m"", mana ọ bụzị mgbe i bidoro ka ị ga-ama ma ị chọrọ ka agbamakwụkwọ gị bụrụ ọnụkwube kaọbụ ka ọ bụrụ obere agbamakwụkwọ. *Mara na nke a abụghị n'usoro o kwesịrị isi gaa, mana ha niile so n'ihe nwaanyị na-ahazi. 1) Nhọpụta isi atụmatụ nke ụbọchị ahụ: Ihazi ihe ndị Bekee kpọrọ 'theme' bụ otu ihe na-adị nwaanyị na-agba akwụkwọ mkpa. Ọ na-adị nwaanyị mkpa n'ihi na ọ na-eso ekwu etu nwaanyị ga-esi echeta ụbọchị agbamakwụkwọ ya; nwaanyị na-eji atụmatụ a emepụta ebumnobi ya. Atụmatụ a na-eso egosikwa etu ụbọchị ahụ ga-esi aga, ihe dịka ejiji ndị mmadụ ga-eyi, ụdịrị agwa (color) ha ga-eyi, ụdịrị egwu ọ chọrọ ka a gbaa maọbụ ka a kụọrọ ya, ụdịrị nri a ga-eri, ụdịrị achịcha Bekee, etu ọ chọrọ ka foto ha ga-ese dịrị wdgz. Etu ọ chọrọ ka ụbọchị agbamakwụkwọ ya dịrị ga-enyere ya aka ịhọpụta ebe ọ ga-anọ eme ya bụ emume. 2) Nhọpụta ebe a ga-anọ agba akwụkwọ: Etu isi atụmatụ ụbọchị ahụ (lee anya n'okwu nke mbụ) ga-adị na-eme ka nwaanyị mara ebe ọ chọrọ ime mmemme ya. Ọ chọrọ ka ọ bụrụ n'ime ụlọ? N'ezi? N'akụkọ mmiri? N'elu ụgbọelu (dịka ome ejije Nollywood bụ Omotola Jalade-Ekeinde mere)? N'obodo a maọbụ na mba ofesi? Mmadụ ole ka ya na di ya ga-achọ ka ha bịa agbamakwụkwọ ha? Ọ bụ eziokwu na ego ji ọrụ, mana ebe ọbụla ọ chọrọ ya ka a ga-anọ mee ya, ihe ọ nyịrị bụ ịgba di ya ọgwụ ka o mee ya obi aṅụrị site n'imezu ebumnobi ya. 3) Nhọpụta ndị ga-eduputa ya (Bekee kpọrọ ya Bridal Train): Ebe ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ahọrọ ụmụnne ha ka ha bụrụ ndị ga-eduputa ya n'ụbọchị agbamakwụkwọ ya, ndị ọzọ na-ahọrọ ndị bụ ezigbo enyi ha. Etu ụwa dị ugbua, ụfọdụ ụmụnwaanyị na-achọzị ihe ọpụrụiche dịka: ""naanị ụmụnwaanyị ndị na-acha ọcha ga-eduputa m"", ""naanị ndị na-ebughi ibu ga-eduputa m"", ""naanị ndị toro ogologo ga-eduputa m"" wdgz Ụfọdụ ndị ọgbara ọhụrụ a na-ahọrọ naanị ndị ha ma ga-akwụnwu ụgwọ akwa ha ma jikee onwe ha. Ebe ọ bụ ha na-ahazi ya, ihe ha bụ nwaanyị na-agba akwụkwọ chọrọ bụ ihe ga-eme. 4) Mkpebi maka nkwado ya: Nwaanyị ka ọ dịrị ikwado onwe ya, site n'ụdịrị uwe ọ ga-eyi agba akwụkwọ, etu ntutu ya ga-adị (ọ ga-ebu ntutu ya ka ọ ga-etinye ihe n'isi), ọ ga-eme ntecha kaọbụ ọ gaghị eme, ụdịrị akpụkpọụkwụ ọ ga-eyi, ọ ga-eji akpa n'aka ka ọ ga-agba aka nkịtị, wdgz. Ihe ndị a niile bụcha mkpebi dịrị nwaanyị tupu agbamakwụkwọ ya ebiri ọkụ. Mana nke kaara nwaanyị mma bụ ime ihe ebe akpa ya na di ya ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56712206 +sports Leicester City vs Arsenal: Leicester City ewerela egbe ndị Arsenal gbawaa ha isi Ndị otu egwu bọọlụ Leicester City ji egbe ndị Arsenal wee gbawaa ha isi n'asọmpị 'English Premier League' nke taa. Ọkpụ goolu abụọ chara acha ka ha ji wee dulaa ha mmụọ. Jamie Vardy gosiri na ike agwụbeghị ya chaa mgbe o nyere goolu nke mbụ na nkeji 68. James Maddison gbakpukwara goolu nke abụọ na nkeji 75. Arsenal enwetaghị onwe ha chaa chaa na ya bụ Asọmpi. Nwaafọ Igbo bụ Wilfred Ndidi ekweghị Mesut Ozil megharịa ahụ Mmeri a mere ka Leicester gbagorokwa na ndị nke abụọ na tebulu EPL. Arsenal n'onwe ha bụ ndị nke isii. Akara iri na atọ ka Liverpool ji agafe Arsenal ugbua. N'egwuregwu ndị ọzọ, Chelsea pịawara Crystal Palace azụ mgbe ha ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie ha. Nwaafọ Naịjịrịa bụ Tammy Abraham na Christian Pulisic bụ ndị nyeere ha goolu. Everton bụ ebe nwaafọ Igbo bụ Alex Iwobi nọ, meriri ndị Southampton 2-1. Newcastle merikwara Bournemouth 2-1, ebe Tottenham na Sheffield United nyere onwe ha otu ọkpụ otu ọkpụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50361806 +business Demas Nwoko: 'Ịrụ ụlọ ekwesịghị iri gị ego makana ihe e ji arụ ya dị n'ala' A bịa na ndị na-ewu ụlọ na Naịjirịa otu onye aha ya na-ada ezigbote ụda bụ Demas Nwoko. Otu ihe kpatara ya bụ na Maazi Nwoko na-etinyekarị akara ndị gboo ji ewu ụlọ, n'ụlọ ndị ọ na-arụ. Ọzọ bụ na Demas amụghị iwu ụlọ amụ. Ọ kọwara na ọ bụ ọnatarachi ya dịka nna ya na nna nna ya bụ ndị na-arụ ụlọ. N'ihe nkiri a, Demas kọwara ihe mere o ji na-ekwu na ịrụ ụlọ abụghị ihe kwesịrị iri ego maka ọtụtụ ihe e ji arụ ụlọ dị n'ala. Lee nkọwa ya nakwa ụlọ o jiri mee ngosiputa n'akụkọ a Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo mere. https://www.bbc.com/igbo/afirika-51513692 +entertainment New Zealand Video: Ụlọọrụ soshal midia na-agbali ịkwụsị nkesa ihe onyonyo nke Brenton Tarrant kesara "Akụkọ ndị dị mkpa taa: A kpụpụla Brenton Tarrant, onye a na-enyo enyo dika isi a hụrụ kwaba okpu na ihe ọdachi ịgbagbu mmadụ iri anọ na itoolu nke mere n'ụlọụka Alakuba abụọ na mba Nu Ziland ụlọikpe. Mba ụwa nọ n'anya mmiri dịka e ji egbe gbagbuo mmadụ iri anọ (49) ma merụọ opekata mpe mmadụ iri abụọ n'ụlọụka Alakụba abụọ dị n'obodo ChristChurch dị na mba Nu Ziland n'ụbọchị Fraide. Otu onye ji egbe so na mkpakpa ahụ nke a na-enyo na ọ bụ Brenton Tarant gosiri onwe ya dịka ọ na-akwa mgbọ n'ime ụlọụka Alakụba. Ndị ụlọọrụ soshal midia dịka Facebook,Twitter na Youtube agbaliala ị wepụ ihe onyonyo ahụ mana ndị mmadụ ka na-eke ya n'ebe dịa nille gụnyere na Whatsapp. na agbanyeghị na ndị uweojii dụụ ọdụ ka a kwụsị ikesa ya. Onyeisi mba Nu Ziland bụ Jaccinda Arden katọrọ oke ọdachi mere n'ala ha nke o kwuru na ""ụbọchị jọkarịchara"" nye mba ahụ. Otu onye bu egbe nke kpọrọ onwe ya onye Australia aha ya bụ Brenton Tarrant gosiri onwe ya dịka ọ na-agbasasi egbe n'ụlọụka Alakụba Al Noor Mosque. Ndị uweojii anwuchiela ya bụ nwoke dị ihe dịka afọ iri abụọ nakwa nwoke abụọ ọsọ na otu nwaanyị ma kpụpụ ha ụlọikpe maka ebubo igbu mmadụ. Ndị uweojii dọkwara aka na nti ka ndị mmadụ hapụ ebe okpukpere ụka Alakụba na mba ahụ ganye n'udo alọghachi. Otu onye nọ ebe o mere gwara ụlọọrụ akụkọ New Zealand na ya hụrụ nwoke ahụ ka ọ gbara otu nwoke egbe n'obi. ""Anọ m na-eche, na-ekpe ekpere , Chineke mee ka mgbọ gwụ n'egbe nwoke a."" Ọ gba egbe ebe, ọ gba ebe o sị n'ọnụmara ụmụnwoke na-ekpe ekpere gaa fee na nke ụmụnwaanyị. ""Anụrụ m na otu nwaanyị na ndị ọ gbatara anwụọla."" _____________________________________________________________________________________________________________________________________ Ụlọ elu ogogo atọ adaala a na-arụ ọhụrụ adaala na Molete dị n'Ibadan nke Oyo Steeti. Dịka ọ dị ugbua a mabeghi mmadụ ole nke a metụtara dịka ndị ọrụ gbatagbata a bịabeghi n'ebe ahụ dịka @TopsyAshaolu siri kwuo n'akara twitter ya; Ndị Ụlọọrụ gbata gbata bụ NEMA n'ịchafụ a nabatala mmadụ dị otu narị na iri asaa na anọ bụ ụmụafọ Naịjirịa esi mba Libya tụbata. Onye nchịkọta ụlọọrụ a na Legọs bụ Idris Muhammed kwuru na ọnụọgụgụ ndị a ga-eme ya mmadụ puku iri na abụọ, narị ise na iri asaa na anọ atụbatarala. Otu jikoro ndị ọrụ bụ NLC n'aha ịchafụ akatọọla Inec maka etu ntuliaka 2019 siri gaa ma kpoo oku ka ha hụ na mmegharị ntuliaka na steeti ụfọdụ nke e hiwere n'abali iri abụọ na atọ nke ọnwa Maach gara n'anya ya. Ekweghị n'ihe Inec mere-Okorocha Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na Inec enweghị ikike ị nara ya ọkwa dịka onye a họpụtara ga-anọchịte anya mpaghara Ọlụ n' Ụlọomeiwu Ukwu. Okorocha, onye kwuru nke a oge ọ na agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja,ụbọchị Wenezde sịrị na ihe na-eme ya sị n'aka ndị na-akpa nkata iji hụ na ọnụ agaghị na-eru ya n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị. Inec wọrọ asambodo mmeri e nyere ndị meriri azọmọkwa sinete ụbọchị Tọzde. N'egwuregwuEintrachcht Franfurt (entrank frankfot) achụọla Inter Milan ọsọ ụkwụ ete aja n' Europa league dịka ha ji otu ọkpụ gbapụ ha were nweta ọnọdụ n' agba nke abuọ tupu nke ikpeazụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-47580194 +entertainment Kabusa Oriental Choir: 'Egwu anyị na-atọwa mmadụ niile ntị' 'Kabusa Oriental Choir' kọwara BBC Igbo etu esi nye ha mbo mbo ọsọ mgbe ha malitechara imepụta ihe nkiri. O nyewela ha ego? Chọpụta n'ihe nkiri a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48979748 +health Gịnị mere ụmụ Naijiria na-agbagha ọnụọgụgụ coronavirus NCDC na-ewepụta? "Kemgbe abalị ole na ole gara aga, mpụtara ngụkọ 'National Centre for Disease Control (NCDC)' ọnụọgụgụ gbalitere n'ụzọ pụrụ iche, ụmụ Naijiria ji enyo ele ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naijiria. Nke a bụ n'ihi ngụkọ ha wepụtara n'abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ nke gosiri na mmadụ 11,118 gbakere n'ọrịa coronavirus n'otu abalị dịka o ha kwuru na mmadụ 31851 agbakeela kemgbe ọrịa coronavirus ji bata Naijiria. N'abalị atọ nke ọnwa Ọgọstụ, NCDC wepụtara mmadụ dị 20663 dịka ndị gbakerela n'ọrịa coronavirus. Ya bụ nnukwu mgbanwe gbara ọtụtụ mmadụ baa, ma mee ka ụfọdụ kwuwe na o nwere ike ịbụ ndehie. Mana ka otu abalị gara NCDC na ndị ọrụ ya ekwughị na o nwere ndehie ọbụla ha mere, ụmụ Naijiria bidoro ntamụ, ụfọdụ na-ajụ ebe akatamkpo ọnụọgụgụ ahụ si. Ihe kachasị gbagwojuo ndị mmadụ anya maka ngụkọ ahụ bụ na ọtụtụ ndị ahụ a sị gbakere si na Legọs. Malachy Ani, onye ihe gbasara ngụkọ ego doro anya sị na ""ndekọ ahụ ha na-enye anyị abụghị ezi ya, ọ dịka wayo"". Anị gara n'ihu sị , ""Ndepụta ngụkọ na-ele ya kwa ụbọchị dị iche n'ụzọ pụrụ iche na nke a na-edepụta kemgbe ọrịa coronavirus batara Naijiria."" ka o kwuru ""O nwebeghị ụbọchị iri mmadụ ise gbakere n'otu ụbọchị, kedụ ka mmadụ karịrị puku iri na otu si gbakee n'otu ụbọchị."" ""Ihe o gosiri bụ na ndị na-enye anyị ngụkọ a anaghị etinye anya n'ọrụ."" Ani jụrụ ajụjụ sị, ""Ọ bụrụ eziokwu na ndị ahụ gbakere n'ezie, a sị ha lawa, kedụ ebe ndị ahụ si were la."" Data kwesịrị inye anya aka n'ịtụ alo, mana ụdị ngụkọ onweghị ihe anyị ga-eji eme."" Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwukwa otu ahụ na soshal midia. Ụfodụ na-ebo gọọmenti ebubo ime wuruwuru, o nweghị mgbe ọrịa ji dị na Naijria kama ndị ọrụ gọọmenti ji ụgha a kpara ego. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ dịka ego a mapụtara maka ibu agha megide coronavirus agwụla nke mere ka ndị ọrụ gọọmenti ọ dị n'aka ji agwọkọ ngwongwo ha. NCDC kọwara na ọtụtụ ndị ndị gbakare na Legọs bụ ndị a nọ n'ụlọ ha eleta. Onyeisi NCDC bụ Chikwe Ihekweazu kwuru na nsonso dịka ndị mmadụ na-adọrịta ụka ebe 11,1888 si na, NCDC nyere steeti ga-ugboro ha ga-agbaso maka ileta ndị bu ọrịa n'ụlọ ha. Otu n'ime ọnụ na-ekwuruchitere onyeisi NCDC bụ Emeka Oguanuo gwara BBC na ndị ahụ gbakerela sokwa n'ọnụọgụgụ ndị e kwuburu na ha butere nje coronavirus." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53684971 +entertainment Ned Nwoko: Asịrị e jiri m gbaa na 'social media' ka wutekarịcha m "Dịka ọtụtụ mmadụ na-ekwusi ike etu uche ha dị maka atụmatụ iwu a kpọrọ ""social media bill"" na Bekee, Sinetọ Ned Nwoke gwara BBC Igbo na ya nabatara ya. Ọ sị na ihe mere ya jiri nabata ya bụ ihe mere ya n' soshal midia, ebe o tu nwata nwoke ọ maghị boro ya ebubo ịbụ nna ya. O kwuru na nwata ahụ boro ya na-aya tụwara nnne ya ime, gbalaga. Ọ sị na etu ndi mmadụ jiri na-emetọ aha mmadụ nakwa na-ebo ebubo aghara aghara mere o jiri kwesi na e nwere ihe eji etinye anya na ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-55625568 +sports Nigeria vs Cameroon: 'Super Eagles' ga-ezute 'Indomitable Lions' Akụkọ ndị dị mkpa ụbọchị Tuuzde, Julai 2: Ndi otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Naijiria ga-ezute ndị ogbo ha nke mba Cameroon a na-akpọ 'Indomitable Lions' n'agba nke abụọ nke AFCON 2019. Asọmpi a ga-ebiri ọkụ n'ụbọchị Satọdee abalị isii nke ọnwa Julai 2019 ma ọ kụọ elekere ise nke uhuruchi. Mgbe ndị otu egwu bọọlụ Nigeria zutere ndị Cameroon nke ikpeazụ bụ mgbe ha sọrọ mpi n'afọ 2018 iji ma ndị ga-eso gbaa iko mba uwa na Russia. Naijiria ji ọkpụ goolu anọ asataghi asata merie Cameroon na Uyo, Akwa Ibom steeti, ebe ha nyerịtara onwe ha otu goolu otu goolu na Yaounde. A họpụtala ndị ga-enye aka ịchịkọta Ụlọomeiwu Ukwu ndị gụnyreere aka chịburu steeti Abia bụ Orji Uzor Kalu bụ onye a họpụtara dịka 'Chief Whip' Onyeisi ụlọ omeiwu ukwu bu Ahmad Lawan nọrọ n'ọgbakọ nke ndị omeiwu ahụ nwere n'ụbọchị Tuuzdee wee kpọpụta ha. Ụkwụ Mikel apụọla n'Afcon? Akụkọ si mba Egypt na-ekwu na Mikel Obi agaghị eso na agba nke ọzọ nke AFCON 2019 n'ihi ahụ o merụrụ mgbe Super Eagles Zutere Madagascar. Mikel merụrụ ahụ n'ikpere na asọmpi Naijiria na Madagaska tupu e webata Alex Iwobi ka ọ nọchie ya na nkeji 59. Ka ọ dị ugbua, a na-atụ egwu na Mikel nwere ike ọgaghị agbakecha nke ọma tupu AFCON ahụ agwụchaa nke pụtara na ọ gaghị esokwa na gbaa bọọlụ ọzọ. Mikel ekwubuola na asọmpi nke afọ a nwere ike ịbụ nke ikpeazụ ọ ga-esonye na iko mba Afrịka. Ụlọọrụ onyeisiala Naijiria agọọla na akụkọ na-efegharị na onyeisiala Buhari ewepụtala aha ndị Mịnịsta ya bụ asị ọcha. Ọnu na-ekwuru Buhari bụ Garuba Shehu kwuru n'akụkọ dị otua esighi n'aka ya pụta. N'ofesi Onyeisi ụlọmeiwu mba Algeria bụ Mouad Bouchareb etinyela akwụkwọ arụkwaghịm dịka ngagharịiwe na ọgbaghara na-aga n'ihu maka ọnọdụ obodo ahụ. Ndi na-eme ngaghariiwe chọrọ ka ndị ọchịchị obodo ahụ nile rituo ma gaa zara ọnụ ha n'ụlọikpe. Ihe ruru mmadụ 50 anwụọla na Benue ka tanka gbara ọkụ Tanka bu mmanụ ụgbọala gbara ọkụ n'obodo Ahumbe n'ụzọ Alliade - Makurdi n'okpuruọchịchị Gwer East nke Benue steeti ebe ha chere na ọtụtụ nwụrụ, dịka onye hụrụ ihe mere sịrị kọọrọ ndị ntaakụkọ. Ndị uweojii gwara BBC na mkpamkpa a mere n'elekere abụọ nke ehihie na Mọnde n'ụbochị Julaị nke mbụ, 2019. A tọhapụla Magajin Garin Daura, Alhaji Musa Umar Uba, n'aka ndị tọọrọ ya ka o mere ọnwa abụọ n'aka ndị ntọ. Ndị otu isiekweọnwụ ndị uweojii a kpọrọ 'IGP Intelligence Response Team'(IRT) azọpụtala Alhaji Musa Umar Daura Magajin Garin Daura nke Katsina Steeti n'aka ndị ntọ. A tọrọ nwaamadị ahụ kemgbe abalị mbụ nke ọnwa Mee afọ 2019. Ndị ntọ ahụ tọọrọ ya bụ Eze obodo n'obodo ya na Kastina. Site na ntuziaka IGP Adamu Mohammed, ndị otu IRT nke onye ndu ha bụ Abba Kyari ji izu isii maa imi n'ala site na enyemaka ndị OC SIB Kaduna nakwa nke ndị Niger steeti ịchọta ya bụ Eze Obodo atọọrọ. Ndị a mara imi n'ala ka nkịta chọwa Eze a ọhịa na ụzọ niile dị na Kaduna, Bauchi, Niger, Katsina, Katsina na Kogi Steeti bụ ebe ha nwụtara ndị omekome iri na otu nke gunyere onyeisi ha mazọpụtakwa Magajin Garin Daura n'akụkụ Panshakara dị na ime obodo Kaduna n'isi ụtụtụ taa bụ abalị abụọ nke ọnwa Julaị. Otu isi onye ntọ nara na ya bụ oke mgbọ ndị uweojii a kwara nke mere eji zọpụta ya bụ onye Eze. A napụtarakwara ha ọtụtụ egbe AK47 na mgbọ mgbe anwụchiri ọtụtụ n'ime ha. Ihe karịrị mmadụ iri abụọ anwụọla na Benue ka tanka gbara ọkụ Ndị akaebe kọwakwara na ọ bụ mgbe ụgbọala ahụ chọrọ ize olulu dị n'okporo ụzọ ka ọ dara ma wusie ihe mmanu ụgbọala o bu n'okporo ụzọ. Ka mmanụ a wasara n'ụzọ, ụfọdụ ndị obodo Ahume pụtara na-ekuru mmanụ a ka ọ na-awụpụ. Ha kwukwara na ọ bụ otu onye ọkwụ ụgbọala gbafere mụnyere ha ọkụ. Ụmụ mmadụ awụọla UK Home office ọnụ maka ịkwụ na ụmụagbọghọ sị Naịjrịa na-agbaga ofesi maka ịgba mbarama na-egosi nnukwu akụ na ụba ma ha lọta. Kate Osamor bụ omeiwu na mba Uk sị na Home Office agbagheghị ahụhụ ụmụagbọghọ ahụ na-ata were kwuwe ụdị ọkwụ ahụ. N'ikpeazụ, onyeisiala Mohammadu Buhari achụọla onyeisi National Health Insurance Scheme bụ Usman Yusuf ọnwa asaa kọmiti ehibere maka ịnyọche ya bụ nwaamadị kwụru otu ahụ. Onyeisiala ewerelarị Mohammed Sambo dochie Yusuf bụ onye eboro ebụbụ ịmemina nde kwuru nde naịra. Abụbụọrụ ọzọ esiwela Ndị otu Joint National Public Service Negotiating Council na ndị ọgbakọ otu ọrụ asatọ ọzọ efolara ntutu taa na ha ga-amalite abụbụ ọrụ ma gọmentị ebidoghị ụgwọ opekatampe ha kwere na nkwa. Onyeisi ndị otu a bụ Anchaver Solomon sị na ha amalitela ịkpọkụ ndị otu ha na steeti niile maka nke a iji hụ na pụkụ iri atọ gọmenti kwetere bịara na mezu mgbe adịghị anya. N'ofesi ozu otu nwoke eche na ozoro na kenya Airline adapụla na Heathrow Airport na London. A na-eche na ya bụ nwoke amatabeghị onye ọ bụ zubara na ya bụ ụgbọelụ na Nairobi, kenya dịka ndị uweojii mba ahụ kwuru. N'egwuruegwu, nwatanta ekponyela Ezenwaanyị tenis, Venus Williams aja n'ọnụ. Cori Gauff gbara afọ iri na ise meriri Venus Williams jigoro tenis riwe ihe tupu amụọ ya n'afọ 2004 asọmpị ha na Wimbledon nke 2019. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48839348 +politics Aisha Buhari: Amaghị m ma anyị mezuru ihe ndị mmadụ tụrụ anya na anyị ga-eme, mere m jiri rịọ ndị Naịjirịa Aisha Buhari bụ nwunye Onyeisiala Naịjirịa, Muhammadu Buhari akọwaala ihe mere o jiri rịọ ụmụafọ Naịjirịa mgbaghara maka ọchịchị di ya. Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC nwere, Aisha sị na n’uche nke ya, na ọ cheghị na di ya mezuchara ọtụtụ nkwa ndị o kwere oge ọ na-achụ nta vootu tupu ọ banye ọchịchị. O kwuru na ọ bụ n'ihi nke a ka o ji rịọ ndị Naịjirịa mgbaghara, maka na o nwere ike ha emeghi ihe ndị mmadụ na-atụ anya n'aka ha. Mgbe a jụrụ ya ebe ndị o chere ọchịchị di ya emeghi nke ọma, Aisha kwuru na ọ maghị. O kweghikwa etinye ọnụ n'okwu gụnyere mkpamkpa oke idemmiri na-akpa na steeti dị iche iche na Naịjiria, ndị ntorobịa nakwa ụmụnwaanyị na ndọrọndọrọ ọchịchị, dịka ọ sị na ndọrọndọrọ ọchịchị agbasaghị ọrụ ọ na-arụ. N'okwu ya, “Ụlọọrụ nke m dị ka ebe a na-enyere ndị mmadụ aka, ana m anabatakarị ndị mmadụ ebe a ma kwado ha n’ihe banyere ahụike na agụmakwụkwọ”. A nọ n'ụlọọrụ ya n'Aso Villa gbaa ya ajụjụ ọnụ a, ebe ọ nọ kwuo na e nweghi bọjeetị e kewapụtara maka ọrụ ndị a ọ na-arụ dịka nwunye onyeisiala. Gbasara kepukepu ka o bi na Dubai karịa Naịjiria, Aisha Buhari kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu. Ọ rụtụkwara aka n'akụkọ pụtara na ọ chọrọ ịbanye ndọrọndọrọ ọchịchị ma zọọ ọkwa. Ọ gwara BBC na ọ na-atụ anya ya na ezinaụlọ ya ịnọkọ ma ọ laa ezumiike nka. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ naghị azọ ọkwa ọbụla, n'ihi na o cheghi na o nwere ọkwa ọzọ ga-akarị nke ọ bụ - nwunye onyeisiala. Aisha gara n'ihu kwuo na o nwere olileanya na otu All Progressives Congress (APC) nọ n’ọchịchị ugbua ga-alaghachite n’ọkwa ma e mechaa ntuliaka n’ọnwa Febrụwarị afọ 2023. Gee ihe ndị ọzọ o kwuru n’uju ebe a: https://www.bbc.com/igbo/articles/c3gz1k8pe7yo +health Coronavirus Lockdown: Ugbua I nwere ohere, lekwa ihe I kwesịrị ikuziri ụmụ gị "A na-ekwu na ụmụaka bụ onyinye si n'aka Chineke mana ịchịkọta ha ugbua dịka gị na ha nọ n'ụlọ n'oge mmachi ngagharị maka ọrịa coronavirus, adịghị fechafecha. Kedụ ka ọ si aga na be gị? Cheta na ndị nke ka nọ n'ụlọakwụkwọ ọtaakara maọbụ praịmarị agaghị aghọtacha ihe na-eme. Mana ndị nke na-agụ sekọndrị nwere ike ịghọta ihe ha ji nọrọ n'ụlọ apụghị iro. Ihe ka mkpa ibu n'obi bụ na ụmụaka mechiri akwụkwọ n'oge erughị eru nke mere na ha amụchaghị ihe niile ha kwesịrị ịmụta. Ọtụtụ nne na nna bụ ndị na-apụ n'ụtụtụ ma bata n'abalị, nke bụ na ndị nkụzi na ndị na-eledo ụmụaka anya bụ ndị na-ahụzi maka ọzụzụ ụmụaka. Mazi Peter Ezembu bụ onye ọnụ na-eru n'okwu maka ihe gbasara ọzụzụ ụmụaka tụnyere anyị azụ etu nne na nna ga-esi kụziere ụmụ ha ihe n'oge mmachi a. Mazi Ezembu kwuru na dịka nne na nna na-akụziri ụmụ ha agụmakwụkwọ n'oge a, ọ dịkwa mma ka e were ohere a kuziere ha maka omenala ha. O kwuru si: ""Nne na nna ọrụ e nyeghị oghere ịkụziri ụmụ ha asụsụ na omenala obodo ha ga-eji oghere a kụziere ha asụsụ ha. Ezembu rụrụ aka iji akụkọ ifo na ụfọdụ egwu ndị Igbo ji kụziere ụmụaka ọmụmụ n'oge mmachi a. Kụziere ha maka ezinụlọ ha sị Ezembu si na ugbua bụkwa ohere iji kpọtụrụ ndị ezinaụlọ na-ekwentị nke onyonyo ma mee ka ụmụ gị mara ndị bụ ụmụnne ha. Ọ kwuru na nke a na-enye aka n'otuto ụmụaka. Ezembu kwuru sị, ""oge a a bụchaghị ogbatauhie dika ọtụtụ ndi nne na nna si chee, kama ụnụ were ohere a kụziere ụmụaka ụnụ ọmụmụ maka omenala na ezinaụlọ ebe ha siri bia"". N'aka nke ọzọ, e nwere ụfọdụ atụmatụ nne na nna ga-eji hụ na ụbụrụ ụmụ ha akpọchighị n' oge a, ọkachasi ndị na-akwado ule dịka WAEC. Atụmatụ ndị a gunyere: Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-52143303 +health Mosquito Bites: Lee ihe asaa mere ahụ gị ji adọta anwụnta karịa ndị ọzọ Ọtụtụ oge ka ụfọdụ mmadụ na-ekwu na anwụnta anaghị ekwe ka ha tinye ụra n'anya. Mana ndị ọzọ nọkwa n'otu ebe ahụ anaghị aghọta ihe ha na-akọ n'ihi na anwụnta anaghị ata ha. Nke a bụ maka na ndị ahụ ha na-adọta anwụnta karịa ndị ọzọ. Ihe na-akpata anwụnta ji agakwu ụfọdụ ma na-agbara ụfọdụ ọsọ dị icheiche. Nnyocha Sayensị gosiri n'ezie na ọ bụghị mmadụ niile ka ahụ ha na-amasị anwụnta. 1) Agwa (Colour) Nnyocha egosila na anwụnta na-achọkarị ebe gbara ọchịchịrị karịa ebe nwere nnukwu ihe. Nke a pụtara na anwụnta ga-aka agakwu onye yi uwe ojii maọbụ uwe na-anaghị amuke amuke. Ọ bụrụ na i yi akwa ojii, o nwere ike bụrụ ihe na-adọtara gị anwụnta. 2) Ọsịsọ (Sweat) Ọ bụrụ na i nwere ahụ na-agba oke ọsịsọ, mara na gị na-anwụnta ga-abụ nnu na mmanụ. Nke a bụ maka na nnyocha gosiri na ebe na-ekpo ọkụ ma nwee mmiri, na-amasị anwụnta nke ukwuu. Chetakwa na ọsịsọ nwere isi ọ na-ewepụta n'ahụ mmadụ nke nwekwara ike ịdọta anwụnta. 3) Mmanya na-aba n'anya (Alcohol) Na 2020, ndị ọkachamara mere obere nnyocha nke gosiri na anwụnta na-aka agakwu ndị ṅụrụ mmanya na-aba n'anya, ọ kachasị nke bekee na-akpọ 'beer'. O dochaghị anya ihe kpatara nke a, mana a na-eche na o nwere ike ịbụ maka isi ya. 4) Ụdị ọbara Nnyocha gosiri na ndị nwere ụdị ọbara O na-aka amasị anwụnta karịa ndị nwere ụdị ọbara A maọbụ B. Iji mee nnyocha a, e tinyere mmadụ ole ma ole n'ime otu ọnụ ụlọ, mana anwụnta tara ndị nwere ụdị ọbara O pasentị 83, ebe ọ tara ndị nke ọzọ pasentị 46.5. Mana a ka na-eme nnyocha iji mata ihe kpatara nke a. 5) Onye dị ime Dịka ụfọdụ nnyocha siri gosi, ahụ ụmụnwaanyị dị ime na-aka amasị anwụnta karịa ndị na-adịghị ime. Nke a nwereike ịbụ maka maka na ahụ nwaanyị dị ime na-ekpotụ ọkụ karịa onye nke adịghị ime. Ụmụnwaanyị dị ime na-akakwa ekuputa ikuku 'carbon dioxide' karịa. Ụdị ikuku a na-amasị anwụnta nke ukwuu. 6) Mgba isi ọma (perfume) Cheta na enwere okooko (flower) na-amasị ụmụanwụnta ifega. Chetakwa na ọtụtụ mgba isi ọma bụ okoko ndị nwere isi ọma ka e ji emepụta ha. Ọ bụrụ na ụdị mgba isi ọma nke ị gbara na-ahụ gị bụ ụdị nke e ji okoko na-amasị anwụnta mepụta, mara na gị na anwụnta ga-abụ enyi n'ụbọchị ahụ. 7) Ahụ isi Ihe na-akpata ahụ mmadụ ji esi isi, maọbụ 'body odour' na bekee, bụ ihe anaghị ahụ anya nke bekee na-akpọ 'micro organisms'. Ihe ọzọkwa bụ mburupụtaụwa bekee kpọrọ 'genetics'. Ọ bụrụ na mmadụ nwere ahụ isi, anwụnta nwere ike ị na-abịakwute ya karịa. Nke a bụ maka na anwụnta na ụmụ 'micro organisms' ụfọdụ na-akpata ahụ isi na-adị na mma. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58531552 +sports French Open: Serena Williams apụọla Ụlọ ntaakụkọ AP na-ekwu ugbua na agbara ewguregwu Tennis bụ Serena Williams apụọla na French Open. Ha kwuru Williams pụrụ na-egwurewgu ka ọ pụtara na o nwere asọmpị ya na Maria Sharapova ka ga-agba. Lee ebe ndị AP gbasara akụkọ a n'elu akara soshal midia Twitter ha: Serena dị afọ ịrị atọ n'isii gwara ndị ntaakụkọ n'obodo Roland-Garros nke mba France taa n'ọbụ n'ihi ahụ ọ merụrụ n'obi ka o ji pụọ n'asọmpị ahụ. Serena na Maria Sharapova na-akwado ịgba asọmpị agba nke anọ taa bụ Mọnde. Lee ihe BBC Sport dere na Serena kwuru: Nke na-egosi na ọ bụ maka ezinaulo ha ka o jiri rapụ asọmpị a. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44359637 +business Ngozi Okonjo-Iweala: Ala Igbo nwere ihe niile n'iji kwalite akụnụba Naịjirịa "Dọkta Ngozi Okonjo-Iweala nwere mkparịta ụka pụrụiche na BBC Igbo a kpọrọ ""Kwuo Uche Gi"". Na mkparịtaụka a, Okonjo Iweala kwuru na ya kwụwara aka ya ọtọ oge ọ rụrụ ọrụ dịka Mịnịsta Ego nke Naịjirịa n'oge Olusegun Obasanjo nakwa Goodluck jonathan chịrị ọchịchị. Gee ọkpụrụkpụ okwu Dkt Ngozi Okonjo-Iweala kwuru ebe a: O kwuru sị: ""Nne m na nna m nyere m ọzụzụ dịka ndị Igbo. Ha gwara m ka m were ụbụrụ m wee chepụta ezigbo echiche kama iwere ihe onye ọzọ."" ""Edebere m aka m ọcha. Obi m dịkwa ọcha."" Oge anyị jụrụ ya maka akụkọ kwuru na gọọmenti Abia steeti kpọrọ ya ka ọ bịa nyere ha aka ịdozi akụnaụba ha, Okonjo-Iweala kwuru na nke ahụ abụchaghị eziokwu. Ọ kọwara na ya gụtara ya bụ akụkọ na 'newspaper' mana ya ahụbeghị akwụkwọ ozi si n'aka gọọmentị Abia. O kwekwara nkwa ya ga-enye nkwado ma a kpọọ ya ụdị oku ahụ. Ọ gara n'ihu kwuo na obi dị ya ụtọ na ọ bụ ya bụ nwaanyị mbụ bụ minista okwu ego dị n'aka na Naịjirịa, nke megheere ụmụnwaanyị ndị ọzọ ụzọ kemgbe ahụ. N'ajụjụ maka etu mba Afrịka ga-esi pụta na ọgbatauhie sọ coronavirus, Okonjo-Iweala kwuru na gọọmentị ndị mba Afrịka kwesịrị ibu ụzọ lebaa anya n'ihe ha ga-eji kwalite akụnụba ha n'oge a. O rịọkwara ka gọọmenti nye ndị mmadụ ihe oriri, ego na ihe ndị ọzọ eji enyere ndụ aka n'ihi na ọrịa a egbochiela onye ọbụla ịga ọrụ. O kwuru na ""ọ bụrụ na ị ga-asị ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ, na ị kwesiri ịnye ha ihe ga-eji nọrọ n'ụlọ.""Okonjo-Iweala kwukwara na ihe o ji dị oke njọ n'Afrịka bụ na ""tupu coronavirus abịa, Afrịka nwere oke nsogbu n'akụnaụba ha."" Kama ọ rịọkwara ka ndị mmadụ gee ntị na usoro ndị ọrụ ahụike wepụtara maka ịgbochi ya bụ ọrịa dịka ịkwọ aka, ikpuchi imi na ịgbalahụ ebe ọtụtụ mmadụ nọ. Ọ sị na ya bụ ọrịa adịghirị onye ọbụla mfe. Mgbe ajụrụ ya ma onwere uche n'ọchịchị Naịjirịa, Okonjo-Iweala zara na ya efeela ala Naịjirịa oge ya na Obasanjo nakwa Jonathan rụrụ. O kwuru sị: ""Ugbua, ọrụ m na-arụ bụ nke Afrịka na nke mba ụwa. Ọrụ a dị m ụtọ n'obi nke ọma."" Okonjo-Iweala kwere nkwa ịhụ na ndị Igbo nwetere oke ruru ha ma na-arịọkwa gọọmenti ala Igbo ka ha gbaa mbọ hụ na ego nke ha nwere n'ụlọ banyere n'ihe ga-enyere ọha na eze aka dịka ezigbo ụzọ, ọkụ na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka. Ọ sị na ọbụrụ na ndị ọchịchị ala Igbo kwụwa aka ha ọtọ na ihe gbasara ego dị n'ụlọ na ọ ga-adị nfe iwebata ego ọzọ n'ụlọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52553469 +health Covid-19 n'otu nkeji: 'Menthol' ọ na-egbochi ọrịa coronavirus? E nwere ihe onyonyoo na-efesa na soshal midia ugbua ebe onyeisiala mba Guinea bụ Alpha Conde na-ekwu na ite ihe na-ekpo ekpo bụ 'menthol' n'imi nwere ike igbochi mmadụ ibute ọrịa coronavirus. O kwukwara na mmiri ọkụ na-egbochi ya bụ ọrịa. Mana ihe ndị a bụ akụkọ mbe agaba, maka na onwebeghi nnyocha gosiri na ihe ndị ahụ dị ire. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chukwunaeme Obiejesi https://www.bbc.com/igbo/afirika-52476161 +sports Egypt vs South Africa: 'Ndị Ijipt ị hụrụ ugbua, ị gaghị ahụ ha anya ọzọ' "Anya ndị otu egwuregwu South Afrịka ji wee pụta ịsọ mpi na ""Africa Cup of Nations"" (AFCON) na-eme ugbua pụkwara iche. Ha kụpụrụ ndị otu egwuregwu bọọlụ Ijipt, chụlaa ha ma febanye n'agba anọ nke ikpeazụ. Ndị Ijipt gbara mbọ na-ewebata ndị ọgba bọọlụ aghara aghara, mana Thembinkosi Lorch nara ha ụra rahụ mgbe o nyere goolu kwofere ndị Saụt Afrịka ka nkeji iri asatọ na ise gachara. Mahmoud Trezeguet bụ onye kara ịzọ ndị Ijipt n'asọmpị ahụ, gbanyere bọọlụ n'aka onye na-eche goolu kama ịgbanye ya n'ime ọjọgọrọ goolu. Etu ọ dị ugbua, Ijipt esorola Kamerun n'azụ dịka ndị achụpụrụla n'asọmpị AFCON 2019, ebe Saụt Afrika ga-aga Kaịrọ ebe ha na ndị Naịjirịa ga-achịpụ ya n'agba anọ nke ikpeazụ n'abalị iri nke ọnwa Julai. Oke osisi Ijipt bụ Mohammed Salah sokwa n'asọmpị ụnyahụ mana ya bụ agha riri ya maka na akụkọ na-ekwu na o jichaghị ahụ wee bịa gba ya bụ bọọlụ. Nke a mere ka ọ na-agbachapụ agbachapụ n'asọmpị ahụ dịka ndị mmadụ si kwuo n'elu Soshal midia." https://www.bbc.com/igbo/48898751 +health Igbo delicacies: Ị hụtụla ụgba pụrụiche maka ndị na-asọ anụ? Nnenna Ubani bụ osite Igbo anaghị eri anụ maọbụ azụ. Ọ na-eme ụgba n'ụzọ pụrụiche n'etinyeghị anụ maọbụ azụ maka ịdozi ime ahụ mmadụ. BBC Igbo gara n'ụsekwu ya ebe ọ gosiri anyị etu o si agwọ ya. Lee ihe anya anyị hụrụ ebe a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50873631 +business Electricity Tariff : 'Anyị ka na-eti mkpu maka ego etinyere n'ọkụ latrik, e tinye ọzọ Obi adịghị ọtụtụ ndị mmadụ maka mbuli e buliri ego ọkụ latrik na Naijiria. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ego ndị ụlọọrụ na-enye ọkụ tinyere: https://www.bbc.com/igbo/afirika-55553795 +sports Man United vs Crystal Palace: A nyakasịala Man Utd ka gwongworo ike ụwa gwụrụ Ndị Manchester United etiela 'ebe ooo' dịka Crystal Palace tiri ha ịkpa n'isi n'asọmpi Premier League. Nke a malitere na nkeji 32 mgbe Jordan Ayew nwa Ghana nyeere ndị Crystal Palace goolu mbụ ha. Man. United shiri ajọọ ọnwụ inyete goolu mana Crystal Palace kpọrọ ekwe nkụ rue n'ebe ngwụcha asọmpia ahụ. N'ihi dịka nkeji 89 ka Man United nwetere goolu site n'aka Daniel James. E cherekwara na egwu agwụla mana Crystal Palace tiri wụrụ Man United n'ala site n'inye goolu ọzọ si n'aka Patrick Van Aanholt na nkeji 90. N'ikpeazụ Crystal Palace ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Manchester United n'ụlọ ha. Chelsea na Norwich City: Otu egwuregwu Chelsea na ndị nkwado ha ga e buru ọkpa ekele nye Chineke maka ime ka ha nwete mmeri mbụ n'asọmpi Premier League nke afọ 2019/2020. Chelsea nwetere mmeri a site n'iji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie ndị Norwich. Goolu malitere izo ka mmiri na nkeji 3, mgbe Tammy Abraham nyeere ndị Chelsea goolu ha. N'egbughi oge Norwich cheere Chelsea aka mgba site na goolu Todd Cantwell nyere na nkeji 6. Mason Mount nke Chelsea gwara Norwich na mmadụ na-akarị ibe ya mgbe o nyere goolu na nkeji 17. Norwich gwakwara Chelsea na ha adịghị achị site n'imezu goolu ha abụọ abụọ na nkeji 31 tupu e gbuchie opi n'ọkara nke mbụ. Dịka ọkara nke abụọ malitere, n'ime nkeji 68, Chelsea gosiri na ha nwere Abraham dịka nna mgbe Tammy Abraham nyere goolu nke abụọ ya n'asompi ahụ. Nke a mere Chelsea ji were ọkpụ goolu atọ Norwich satara abụọ gbapee igodo ji ọnụ ụzọ mmeri ha n'asọmpi Premier League. https://www.bbc.com/igbo/afirika-49460152 +sports Samuel Chukwueze: Gịnị ka ị ma maka onye a na-ekwu na ọ bụ 'ọkacha agba na Super Eagles ugbua'? "A bịa n'ime otu Super Eagles na-achịpụ ya n'asọmpi Iko Mba Afrịka a na-agba n'Ijipt ugbua, Samuel Chimerenka Chukwueze so na ndị a kpụ n'ọnụ. Nwaamadị a gbara afọ iri abụọ, so na ndị ọgba bọọlụ batara ọhụrụ ụkwụ na-aghọ ezi nkọ n'ịgba bọọlụ. Super Eagles nke Naịjirịa nke Chukwueze so anọchite anya ha, abụghị ndị ikpeazụ dịka ha so ndị ogbo ha n'Afrịka n'ịnọchiteanya mba ha. Chukwueze bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbara Super Eagles nakwa otu egwuregwu Villarreal nke mba Spen bọọlụ. A mụrụ Chukwueze n'ụbọchị iri abụọ na abụọ, afọ 1999, n'obodo Amaokwe, Ugba, Ibeku dị n'Ụmụahịa, Abịa Steeti . Ọ tọrọ mmadụ abụọ (bụ ụmụnne ya), nwoke na nwaanyị. Chukwueze gụrụ akwụkwọ na 'Government College' nakwa 'Evangel Sekọndịrị' dịcha n'Ụmụahịa. Chukwueze malitere ịgba bọọlụ mgbe ọ dị naanị afọ asatọ. O ji Austin J.J Okocha bụ ""ọgba ncha"" mere onye nlekwasị anya ya. O bu ụzọ gbaara otu egwuregwu ""Future Hope"" bọọlụ, mechaa gbaara ndị ""New Generation Academy"". Dịka ọ na-agbagote n'afọ, Chukwueze banyere otu ""Diamond Football Academy"" tupu o soro ndị otu egwu Naịjirịa 'Golden Eaglets' nọ n'okpuru afọ 17. N'afọ 2018, Chukwueze malitere njem iso ndị Super Eagles nke Naịjirịa agba bọọlụ n'asọmpi enyi na enyi ha na ndị Yuganda. N'ọnwa Mee afọ 2019, a kpọrọ ya oku iso gbaa asọmpi Iko Mba Afrịka nke na-aga n'ihu ugbua. Ụkwụ na-aghọ ya ezigbo nkọ n'ịgba bọọlụ. Ọ bụ onye ama ama n'ịkpa oke ọkpụkpa na bọọlụ, nke mere ọtụtụ ndị ji atụnyere ya na Arjen Robben nke mba 'Netherland'. Chukwueze so ndị 'Golden Eaglets' mabute Iko Mbaụwa ndị nọ n'okpuru afọ 17 a gbara n'afọ 2015, bụ ebe ọ bụ onye atọ na ndị kachasị nye goolu n'asọmpi ahụ. N'afọ 2016, ọ turuugo dịka ""ọgba bọọlụ kachasị gbapụta ihe"" n'otu egwuregwu 'Diamond Football Academy'. Ọ bụ ya ritere nturuugo ""onye ọgba bọọlụ kachasị baa uru"" n'asọmpi Iko MCL n'afọ 2016. Samuel Chimerenka Chukwueze so na ndị a na-atụ anya ga-amụke ka kpakpando n'asọmpi AFCON nke afọ a. Goolu o nyere n'asọmpị ndị Saụt Afịrịka na Naịjirịa mere ya onye atọchasịrị n'ime ndị nyere goolu n'Afcon nke 2019." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48755381 +politics Buhari eduola Olukayode Ariwoola n'iyi ọrụ dịka ọkaikpe ukwu Naịjirịa Onyeisiala Muhammadu Buhari eduola Olukayode Ariwoola n'iyi ọrụ dịka ọkaikpe ukwu nke Naịjirịa, taa bụ Mọnde, ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Jun 2022. Ariwoola bụ onye na-esote Muhammad ma a gụwa ndị bu ụzọ bụrụ ọkaikpe n'ụlọikpe kachasị nke Naịjirịa. Nke a na-abịa dịka ọkaikpe Tanko Muhammad bụbu ọkaikpe ukwu Naịjirịa gbara arụkwaghị m. Buhari nyekwara ọkaikpe Muhammad nzere 'Commander of the Order of the Niger, (OON), iji kelee ya maka ọrụ ya. Akụkọ na-apụta ugbua na-ekwu na Ọkaikpe ukwu Naịjirịa bụ Tanko Muhammad etinyela akwụkwọ arụkwaghịm. Otu onye enyemaka ya gwara BBC Hausa na Ọkaikpe Muhammad tinyere akwụkwọ arụkwaghịm n'eziokwu. Amabeghị kpọmkwem ihe mere Tanko ji kpebie ịkwụsị ọrụ ugbua; oge ya maka ịla ezumike nka gaara akụrụ ọnụ n'ọnwa Disemba afọ 2023. Mana akụkọ na-ekwu na o nwereike ịbụ nghọtahie dị n'etiti Tanko Muhammad na ndị ọkaikpe ukwu ibe ya kpatara nke a. Cheta na ndị ọkaikpe iri na anọ na-arụ ọrụ n'ụlọikpe kachasị na Naịjirịa degaara Onyeisiala Muhammadu buhari akwụkwọ n'ọdị nso a iji mee mkpesa ma kwuo na Tanko Muhammad anaghị arụ ọrụ ya nke ọma. N'aka nke ọzọ, ndị ntaakụkọ Channels TV na-ekwu na ihe mere Tanko Muhammad ji tinye akwụkwọ arụkwaghịm bụ n'ihi na ahụ esichaghị ya ike. BBC ka na-agba mbọ inwetacha akụkọ a nke ọma. Tanko Muhammad malitere ọrụ dịka ọkaikpe ukwu Naịjirịa n'ọnwa Julaị afọ 2019, oge Walter Onnoghen gbara arụkwaghịm n'ọrụ ahụ. Onnoghen tinyere akwụkwọ arụkwaghịm dịka onyeisiala Buhari boro ya ebubo nrụrụaka. https://www.bbc.com/igbo/articles/cyx30v3d37vo +sports Nigeria vs South Africa: Ugo eberela na mgbagbu "Ndị otu egwuregwu bọọlụ Super Eagles nke Naijiria ekwuola na ha di njikere maka asọmpi nke ha na ndị ogbo ha nke mba Saut Afrịka n'agba anọ ikpeazụ nke iko mba Afrịka. Mba Saut Afrịka gosiri na ha so n'ihe a na-eme mgbe ha gbapụrụ mba Ijipt na-agbanyeghi na ọbụ be ha ka a nọ asọ mpi 'African Cup of Nations' (AFCON) nke afọ a. Nke a mere ka onye nchịkọta ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr kwuo na Saut Afrịka buzi okwu akpụ n'ọnụ ugbu a. Mana Rohr kwukwara na ndị otu ya ma ihe ha ga-eme ma ekeremgba bido. Dịka ọ dị ugbua, ahụ zuru ndị otu Super Eagles niile oke maka asọmpi nke mgbede taa. Mikel Obi bụ onye ndu ha agbakeela nke ọma n'ahụ o meruru mgbe Naijiria zutere Madagaska. N'ọgbakọ ndị ntaakụkọ enwere na Cairo, Ijipt ụnyaahụ, Odịon Ighalo kwuru na ndị Saut Afrịka ma ihe ekwe na-akụ mana egwu ọbụla adịghị ndị ""Super Eagles"" n'ahụ. ""Asọmpi a ga-esi ike, mana anyị akwadoola nke ọma. Obi siri anyi nile ike. Ebumnuche anyị bụ ibulata iko AFCON na Naijiria."" Soshal midia esorola tinye ọnụ n'okwu a dịka Nigeria 2 - 1 South Africa na-ewu. Local Black Man na-ajụ ihe mere mpụtara a ji ewu. Broskie sị na ọ bụ Sawụt Afrịka meriri Naịjirịa 2 - 1. Ije Kelvin sị na Naịjirịa ga-emeri maọbụrụ na ha eyighi uwe a. Cheta na Naijiria na Saut Afrịka ezutela onwe ha ugboro iri na anọ na mgbe gara aga. Naijiria meriri ubgoro asaa ma Saut Afrika meriri ugboro abụọ. Mba abụọ ahụ zutere onwe ha mgbe a na-eme nkwado maka AFCON ebe Saut Afrịka meriri Naijiria na Uyo dị na Akwa Ibom steeti. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48933131 +health Coronavirus: Kedụ ihe ndị mmadụ na-azụ edebe maka adịghị ama ama? "Ihe karịrị mmadụ 95,000 na mba 79 dị n'ụwa bụ ndị buterela ọrịa coronavirus. Dịka ọrịa a na-ekesa n'ụwa niile, egwu ji ndị mmadụ nke mere na ọtụtụ na-azụkọba ihe maka ọ gbajuo dọrọ ma egwu bụrụ onye nọrọ be ya. Mana kedụ ihe ndị mmadụ na-azụ, kedụ ihe na-akọzị ụkọ ugbua? Lee ụfọdụ n'ime ha: N'agbanyeghị na o zughi oke na mgbochi ọrịa a, ịchafụ mkpuchi ihu bụ ihe a na-achọsike dịka akara ọkụ n'ọdọahịa, ọdọọgwụ nakwa n'Amazon kemgbe ọrịa Coronavirus bidoro. Miguel Luiz Gricheno bụ onyeisi ụlọọrụ mba Brazil na-emepụta ịchafụ mkpuchi ihu gwara ụlọntaakụkọ Reuters na, ""Ndị mmadụ na-achọ ịchafụ mkpuchi ihu ka a na-achọ ọlaedo."" Ụlọọrụ ya ji mmaji abụọ welite aka n'imepụta ịchafụ mkpuchi ihu dịka ndị mmadụ na-achọ ya. Nwa mpekere ngwa ahụike abụrụla ihe mba dị icheiche na-achọ achọ maka ndị ọrụ ahụike - ndị nwereike ibute ọrịa ahụ oge ha na-elekọta ndị ọrịa. Otu Ahụike mbaụwa bụ WHO kwuru na ndị ọrụ ahụike nwere mkpa ịchafụ mkpuchi ihu ruru nde 89, na mkpunaka (gloves) dị nde 76 nakwa igegbe anya dị otu nde na ụma isii maka nnyocha ahụ. Onyeisi WHO bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus sị, ""Ụkọ mere na ndị dọkịta, nọọsụ nakwa ndị ọrụ ahụike enweghi ngwa ọrụ zuru oke maka ọrụ ha."" Na mba South Korea, bụ ebe nke abụọ kachasị nwe ọrịa coronavirus, gọọmenti kwuru na ha na-amachi ibupu ịchafụ mkpuchi ihu na mba ndị ọzọ, iwelite mmepụta ya nakwa ịhụ na onye ọbụla anaghị azụkarịa ole ga-ezuru ya izuụka abụọ. Onyeisiala mba ahụ bụ Moon Jae-in arịọla mgbaghara maka ụkọ ịchafụ mkpuchi ihu ma gwa ụlọọrụ na-emepụta ya na gọọmenti ga-amapụta ebe ndokwa ya - ka ha ghara ịtụ uche maka imepụta ya ebe ọ gafere oke. Na mba Thailand, ebe enwere mgbaka ahụ maka ụkọ ịchafụ mkpuchi ihu, gọọmenti hiwere kọmitii lebara anya ịmata ma a na-ebupu ya na nzuzo maọbụ na-ere ya oke ọnụahịa n'azụ ụlọ. Onyeisiala mba France bụ Emmanuel Macron sị na ha ga-enye ọrụ ahụike nakwa ndị bu ọrịa coronavirus. Mmanụ mgbochi ọrịa(Hand sanitisers) Ọnụahịa ịchafụ mkpuchi ihu nakwa mmanụ e ji egbochi mfesa nje arịala n'elụ oji dịka ọ na-adazị mmaji abụọ ihe a na-azụ ya na mbụ na Naijiria. Na mba France, gọọmenti na-agba mbọ ibu agha mmegide ndị na-ere ahịa ngwa nchekwa ahụike n'azụ ụlọ Minista na-ahụ maka ego na mba ahụ kwuru na igwe Twitter ya sị ""Ejikerela m iji iwu tinye anya na-ego ole a na-ere ịchafụ mkpuchi ihu nakwa mmanụ mgbochi nje ma oke ọchịchọ karịa."" Na mba Pakistan, gọọmenti dọọ ndị ahịa aka na ntị maka iji oke ọchịchọ soo ngwa ahịa nchekwa ahụike nakwa ọgwụ. Mịnịsta ahụike mba Iran kwuru na ụfọdụ ndị ahịa na-akpachi ihe ha nwere ma na-ere ya oke ọnụahịa. Dịka ụlọakwụkwọ akụkọ mba Russia bụ Vedomosti, sị kwuo, ndị na-achọ mmanụ mgbochi, ncha nakwa akwụkwọ mposi n'ụlọahịa ọgwụ nakwa ahịa ịntanet n'ọnwa gara aga. Dịka mmadụ ịnọrọ na be ya, sị n'ụlọ na-arụ ọrụ mabụ hapụ ịga akwụkwọ na-agbanyewanye mgbọrọgwụ,ndị mmadụ na-azụkọsị ihde dị ha mkpa maka adịghị ama ama. Na mba Singapore, Japan na Hong Kong, e nwere ụkọ akwụkwọ mposi. Na mba Australia, ike e ji achụ akwụkwọ mposi mere ka ọdọahịa tọgbọọ chakoo na egbughị oge nke n'otu ọdọahịa nyere iwu mmadụ azụla karịa akpa anọ akwụkwọ mposi. Ọ bụghị naanị akwụkwọ mposi ka a na-achọzi achọ ugbua kama akwụkwụ a na-awanye ụmụaka nakwa ara ehi sokwa. N'afọ gara aga, pasent 45 ndị na-azụ ahịa na mba Briten zụrụ nri n'intanet nke na ndị nwere ọdọahịa (supermarket) na-adọ aka na ntị na ọ ga-aka njọ n'afọ dịka ọrịa coronavirus na-aga n'ihu. onye chọọ ka ebutere ya ngwa nrị ọ zụụ ka eji n'oge kwuo ihe ọ chọrọ abali ole na ole tupu oge ọ ga-adị ya mkpa mana ha kwuru na e nweghị ụkọ ọbụla. Mba India bụ ha na-emepụta pasent 20 ọgwụ a na-aṅụ na mbaụwa gụnyere ọgwụ paracetamol bụ ọgwụ e jikarị agwọ ahụmgbu kwuru na ha ga-ewetu aka n'ọgwụ ha na-ebupu na mba ha - maka na ọ bụ Chaina ka ha si enweta oke abụọ n'ime oke atọ n'akọọngwa ha ji arụ ọgwụ ndị a. Mana gọọmenti India kwuru na egwu adịghị na ọgwụ ga-anọru ọnwa atọ. Nchọpụta BBC mere gosiri na enwewala ụkọ ọgwụ na Naijiria na mba Kenya. Ọnụahịa ọgwụ gbaliri mmaji atọ na Kenya ,ebe ụlọakụkọ Daily Trust gbara ama na ụka ọgwụ ga-ebido na Naijiria maka mkpebi a India mere." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51757343 +sports AFCON Round of 16: Benin Republic emeela Morroco akwụrụ echewe ụwa Igbo tụrụ ilu sị na elelịa nwa ite ọ gbọnyụọ ọkụ, nke a bụ eziokwu. Mba Morocco ji anya ha wee hụ nke a taa dịka mba Benin Republic gbaara ha ụgbọnwamkpi n'asọmpi iko mba Afrịka bụ AFCON 2019. Morocco na Benin Repụblic nyere onwe ha otu goolu otu goolu nke mere ka asọmpi ahụ baa na penariti. Ndị Benin Republic dị naanị mmadụ iri wee gbachaa ya bụ bọọlụ n'ihi 'Red card' e nyere otu n'ime ha. Penariti ahụ mechara bie mgbe Benin Republic nyere Morocco goolu anọ asatara naanị otu. Nke a pụtara na Benin agafeela na agba nke ọzọ AFCON 2019 ebe Morocco eberela akwa lawa. Ọ bụ nke izizi Benin Republic na-abanye agba nke atọ AFCON. Ka ọ dị ugbua, mba Senegal na ndị Uganda na-achịpụ ya iji mara onye ga-agafe na agba nke ọzọ. Ndị Super Eagles nke Naijiria ga-ezute mba Cameroon echi bụ Satọdee n'elekere ise nke uhuruchi. Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-48886733 +business Ihe m ji hapụ ọrụ ‘Telecoms’ mepụtawa ‘Yogurt’ – Kingsley Mbah Otu nwoke aha ya bụ Kingsley Chukwumerije Mbah akọwala ihe mere o ji hapụ ọrụ na-enye ya ezigbo ego wụbazie ọrụ nke ya onwe ya bụ ọrụ mmepụta mmiri ara ehi gbara ụka Bekee na-akpọ ‘Yogurt’. \nMaazị Mbah kọwara etu mkpebi ime nke a siri ghara ịdịrị ya mfe n’ihi na mgbe ahụ ọ maghị ma ya bụ atụmatụ aga amịta mkpụrụ. O kwukwara na ọrụ nke mmepụta ‘Yoghurt’ a abụrụla ezigbo ihe uru dịịrị ya na ezinaụlọ ya, ọkachasị nwunye bụ onye malitere ya bụ ọrụ kpọmkwem tupu ọ gawa mba Amerịka maka agụmakwụkwọ ya. O nyere ndị ntorobịa nwere atụmatụ imelite ọrụ nke ha ọtụtụ ndụmọdụ banyere etu ha ga-esi meri ọtụtụ ihe ndị na-echere ụlọọrụ ndị ka na-etolite etolite aka mgba na Naịjirịa. Na mkparịtaụka a Maazị Mbah na BBC Igbo nwere, o kọwakwara etu ya na nwunye ya si malite ọrụ n’ime obi ụlọ ha ma gbagide mbọ ruo ugbua nke bụ na ha e nweela ndị ọrụ ruru asaa nakwa ndị ọrụ ngo karịrị abụọ. O kọwakwara etu ha siri malite ire ngwa ahịa naanị na Legọs steeti ma mwụbaa na-erezị ya bụ ngwa ahịa na steeti Naịjriịa karịrị 14. Kirie ihe onyonyo a ka ịhụ ihe ndị Maazị Mbah na nwunye ya kwuru n’uju ebe a. Ndị mere akụkọ a bụ Makuochi Okafor na Vining Ogu. https://www.bbc.com/igbo/articles/cp3k6y6len5o +health Coronavirus: 'Lockdown' agbanweeela etu ụwa sị atụgharị okirikiri anyanwụ Ijeri kwuru ijeri mmadụ n'ụwa dum nọ n'ụlọ maka mmachi ngagharị (lockdown) n'ihi ọrịa coronavirus - nke a ebidola ịgbanwe etu ụwa si atụgharị okirikiri anyanwụ. N'ihi mmachi a, njem maka ọrụ maọbụ egwuregwu, n'okporoụzọ maọbụ n'okporo ụgbọoloko belatara, ebe ụlọ mmepụta ngwahịa dị arọ mechiri emechi. N'ezie, ọtụtụ n'ime anyị welatara aka n'ihe anyị na-emebu. Nke a mere ka nnugha ụwa na-enugha belata. Ọ bụ ihe ịtụnanya ịmata n'ụwa anyị a dị arụ karịa tọn tarị ijeri isii (six billion trillion tonnes). Ndị ọkammụta sayensịa na 'Royal Observatory' nke mba Belgium bụ ndị nyopụtara mgbanwe a. Ndị nnyocha chọpụtakwara mgbanwe a n'ebe dị icheiche na gburugburu ụwa. Na Nepal, a hụrụ ya. Otu onye na-arụ ọrụ na 'Paris Institute of Earth Physics' kwuru na mgbadata ntụgharị ụwa ha hụrụ n'isi obodo ahụ kara aka. Otu okwu ahụ ka ndị mere nchọpụta na Cal Tech University dị na mba Amerịka kwuru na ihe ha nyopụtara na Los Angeles gbara ha nnukwu gharịị Ikuku dịzị ọcha karịa, ebe okeosimiri deere jụụ. 'Nitrogen dioxide' si n'ụgbọala na injini na-enye ọkụ ebelatala. Ndị sayentịsti kwukwara na oke mkpọtụ na-eme n'obodo mepere emepe belatara. N'otu aka ahụkwa, ndị na-enyocha okeosimiri kwukwara na mkpatụ osimiri belatara Mgbanwe nile abụghị ihe ọhụrụ. Ndị mmadụ na-akpagharị n'ehihie karịa n'abalị nke mere abalị ji ajụ oyi karịa ehihie. Mbelata ntụgharị ụwa na-emekwa n'oge ezumike na mmemme. Mbelata ntụgharị nke mere n'izuụka na ọnwa olemole gara aga yiri nke a na-ahụ oge Ekeresimesi na mba ndị na-ekpe okpukpere Kraistị. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52317855 +health Etu sịga onye ọzọ sere si ebutere gị ọtụtụ ọrịa "Ọtụtụ nnyocha sayensị egosila etu ise sịga si akpatara mmadụ ọtụtụ ọrịa ọjọọ, nke gụnyere kansa ọjọọ dị iche iche. Mana nnyocha egosikwala na sịga ndị esere tụpụ n'iro, so na ihe kacha agbarụ mmiri n'ihi na ọtụtụ kemịkalụ ọjọọ na-esi n'ime ya apụta na-abanye n'osimiri. Nnyocha gosiri na ọnụọgụgụ ike sịga (cigarette filter) ndị mmadụ na-atụfu atụfu karịrị tarị anọ na ụma ise (4.5 trillion) kwa afọ. Ndị ọkachamara sayensị na-ekwukwa na ihe e ji emepụta ike sịga bụ akụrụngwa a kpọrọ 'cellulose acetate', nke bụ ụdị plastik nwere ọtụtụ kemịkal n'ime ya. Ọ bụrụ na mmadụ sechaa sịga ma tụpụ ike ya n'ezi, mmiri maa ya, kemịkal ọjọọ ndị a ga-esi n'ime ya pụta, ọtụtụ ga-abanye na mmiri mmadụ na-aṅụ maọbụ nri mmadụ na-eri. Ajọ kemịkal ndị a na-ebute ọrịa dị icheiche dịka kansa ara, kansa ngụgụ, kansa 'prostates', dgz. Joseph Aston bụ ọkammụta n'ọrịa kansa kwuru na mkparịtaụka ya na BBC sị: ""Onweghị ụzọ ka mma kpamkpam iji tụfuo sịga e sere ese, maka na ha dị njọ n’ahụ mmadụ, ihe ọbụla ọ sọrọ gị mee ha. ""Mana ndụmọdụ ka mma bụ, biko, atụsala ya etu ọbụla dị gị mma. Tụnye ha n’ime ebe e wepụtara maka ịtụnye ike sịga."" Kiri onyoonyoo dị n'elu ka ị ghọta nke a n'uju." https://www.bbc.com/igbo/articles/c03n0n21jpeo +politics Abba Kyari: Onye ọ ga-anọchị anya ya? "Ndị ọkacha mara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị sị n'ebe uche ndị mmadụ dịzi ugbua bụ onye ga-anọchi anya Abba Kyari, bụ onyeisi ndị ọrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari. Kyari so n'otu ndị ọnụ kachasị eru n'okwu n'ọchịchị Onyeisiala Buhari ya mere ọtụtụ na-eche na onye ọbụla ga-anọchi ya ga-eritekwa ụdị ikike o nwere. Otu onye ọkacha mara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị si Mahadum Abụja bụ Abubakar Karị sị na Buhari nwere ọtụtụ ndị enyi o che nwereike ịnọchi Kyari. ""Eche m na Buhari nwereike ịhọrọ otu n'ime Babagana Kingibe, onyeisi ndị 'Custom' bụ Hameed Ali maọbụ mịnịsta agụmakwụkwọ bụ Adamu Adamu dịka onyeisi ọrụ ọhụrụ ya,"" Kari kwuru. ""Ọ gaghị abụ ihe itụnanya ma Buhari họrọ otu n'ime ndị a."" Kari sị na ọ ga-ara ahụ ị sị na gọvanọ Kaduna Steetị bu Nasir el-Rufai ga-abụ onye e nwereike ịhọrọ dịka ọtụtụ ndị mmadụ si na-eche. Ọ sị na ọkwa onyeisi ọrụ nke Onyeisiala dị ezigbo mkpa mana ị gaghị eji ya tụnyere ọkwa gọvanọ. ""Ụfọdụ na-eche na Onyeisiala Buhari ga-ahọrọ onye bụbu mịnịsta ihe na-eme n'obodo bụ AbdurRahman Dambazau mana echeghi m na ọ ga-eme ya maka na Buhari ahọrọghị ya n'ọchịchị ya nke abụọ."" Mgbe anyị kpọtụụrụ onye na-ahụ maka ọdịmma pati APC na Naịjirịa bụ Ibrahim Masari, ọ sị na ọ ka-abụ ụtụtụ ikwu okwu banyere nke a. ""Ebe ọ bụ na ọkwa a abụghị nke a na-emere ntuliaka, ọ ga-adị mma ka a hapụ Onyeisiala Buhari ka o ruchaa uju ọnwụ Kyari tupu o kwupụta onye ga-ewere ọkwa ahụ."" Masari kwuru. Kamgbe Buhari weere ọchịchị nke ugboro abụọ n'afọ 2019, Kingibe abụrụla ezi enyi nye ọchịchị a nke ka nke bụ maka na ọ bụ onye Borno Steeti dịka Abba Kyari. Na-agbanyeghi na onye bụbu Onyeisiala bụ Umaru Yar'Adua chụpụrụ ya n'ọkwa odeakwụkwọ gọọmentị etiti, nke a nwereike imegide ohere o nwere. Tinyekwara ọgbaghaara dapụtara mgbe a kagburu ntuliaka nyere MKO Abiola mmeri n'afọ 1993, Kingibe bụ osote Abiola mana ọchịagha Sani Abacha mechara mee ya mịnịsta ihe na-eme n'obodo. N'ihi ihe ndị a, ụfọdụ ndị si mpaghaara ọdịda anyanwụ nwereike ha agaghị a nabatacha ya. Mana Kingibe maara ihe egwu na-akụ n'ihe banyere ọrụ ọha na eze. Ọ bụ onyeisi ndị ọrụ 'Custom' na Naịjirịa. Ali na Onyeisiala Buhari malitere ịrụkọ ọrụ kamgbe ụbọchị ha n'ọrụ ndịagha. Ọtụtụ na-ahụta ya dịka otu n'ime ndị Buhari tụkwasịrị obi. Ndị enyi Ali na-agba ama etu o si bụrụ onye na-akwụwa aka ya ọtọ, nakwa onye na-eme ihe n'usoro. Ọ bụrụ na e mechaa họrọ ya, nke a nwereike ọ gaghị adị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị makana onweghi onye ọ na-ele anya n'ihu. Ọ bụ ya jị ọkwa mịnịsta agụmaakwụkwọ kamgbe afọ ise Buhari weere ọchịchị n'afọ 2015. Ya na Buhari arụkọọla ọrụ ọtụtụ afọ ma bụrụkwa otu n'ime ndị nwereike ịgakwunwu onyeisi ya n'otu ihu n'ime ọbi ọchịchị Onyeisiala. Tupu e nye ya ọkwa mịnịsta, Adamu bụ onye odeakwụkwọ. Ọ na-ekwupụtakarị uche ya n'ihe na-eme n'obodo nakwa na mba ndị ọzọ. Ọ bụrụ na Adamu mechaa nọchie anya Abba Kyarị ọ ga-abụ ihe ime ụlọ ebe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ga-asị na enweghi oke mgbanwe. Gọvanọ Nasir el-Rufai nke Kaduna Steeti bu coronavirus ugbua - Ya bụ otu ọrịa ahụ gburu Abba Kyarị. Akụkọ kwuru na gọvanọ a nyere aka azụ iji nwete ọkwa a n'afọ gara aga, mana e nweghi ihe akaebe gosiri nke a. Kamgbe Buhari hiwere otu CPC ka el-Rufai malitere ịbụ ezi enyi ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma bụrụkwa onye nwere ọnụ na gọọmentị Naịjirịa. Ọ bụrụ na a họrọ ya dịka ụfọdụ ndị na-ekwu, ọ ga-abụ ohere nye ya n'ịkwalite ebumnobi ya ịbụ onyeisiala na 2023 ma ọ bụrụ Buharị chizuo ọchịchị ya. Ndị ọzọ a na-atụanya nwerike ịnọchi Kyari bụ:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-52357164 +entertainment Tiwa savage viral video: Ihe atọ onyonyo aramara nwere ike ibutere gị ma ọ gbapuo "Kemgbe ihe onyonyo aramara a na-arụ aka na ọ bụ Tiwa Savage nọ na ya gbara na soshal midia, ọtụtụ ndị mmadụ kpụ ya n'ọnụ. Ụfọdụ na-akatọ nwa ada otiegwu a, ebe ndị ọzọ na-enye ya nkwado nakwa nkasịobi. Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ bụ na ndị hụrụ onyonyo ahụ na-ekwu na ha ejighị n'aka na nwata nwaanyị nọ na ya bụ onyonyo bụ Tiwa Savage n'eziokwu. Onyonyo aramara mmadụ ịgbapu n'ịntaneetị nwereike ibutere onye ahụ ihe ọghọm ụfọdụ. Ndị ọkachamara n'ihe gbasara ịhazị ka ọha sị ahụta mmadụ kwụrụ n'ụdị ihe na-apụ onye o metụtara nnukwu ihe n'ahụ. Ọtụtụ ndị okenye na-eme mmekọrịta nwoke na nwaanyị, mana ọ na abụ ihe ịsọ oyi na ntị ma ihe e mere n'ime ụlọ gbaa n'ama. Onye nke ya gbara n'iro, dịka nke e boro Tiwa Savage, ga-ebido zawa ajọ aha. Dịka Joe Anatume ọkachamara n'ihe metụtara nhazi etu ọha sị ahụ mmadụ (Public Relations expert) siri kọwaa, ""Ọ ga-eme ka ndị na-elebu gị nnukwu anya malite na-eletu gị anya."" Anatune bụ onyeisi ụlọọrụ 'B3 Communication' kwuru na n'ihi ihe mere Tiwa Savage, ""ndị na-eso ya ga-amailte were anya ọzọ na-ahụta ya."" Ọrụ, ego nakwa ohere ọma ndị ọzọ gaara abịara gị nwere ike ịgba ọsọ n'ebe ị nọ. Anatune kwuru na agbanyeghị na Tiwa savage abụghị nwanyị eji akụkọ ọjọọ mara, akụkọ a na-efegharị maka ya nwereike ịnapụ ya ego. ""Dịka onye na-eti egwu, ọ bụrụ na m chọburu ime ya ihu e ji ere ngwaahịa m, agaghị m emekwa ya ọzọ,"" Anatune kwuru. Ụdị akụkọ a nwereike ịkụrụ mmadụ ahịa na mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ọ bụrụ nwoke na-alụ nwaanyị maọbụ nwaanyị nọ na di, ụdị akụkọ a nwereike ibute ọgbaghara nwereke ịkụsa alumdinanwunye ha. N'otu aka ahụ, onye na-arụ ọrụ, nwere ike ọ napụ ya ọrụ ya. Anatune kwuru na ụdị akụkọ nwere ike ime ka ụfọdụ ụlọọrụ ji Tiwa Savage meere ihu ha ji ere ahịa sị na ha achọghịkwa ya ọzọ. Mana e tere ogiri, e tere ụgba, o kwuru na ọ gaghị ete aka, ya bụ ihe ewuchaa dịka nnukwu akụkọ ọzọ ga-adapụta na Naijiria. Ọtụtụ ndị a ma ama nke bekee na-akpọ 'celebrity' apụtala ịkwado otu n'ime ha bụ Tiwa Savage dịka aha ya na-ewu ebe niile gbasara onyonyo aramara nke e kwuru na ọ nọ n'ime ya. Ndị ahụ gụnyere Daddy Freeze bụ onye ntaakụkọ Redio a ma ama; Dike Osinachi onye e ji Apama Nolly mara, Mercy Aigbe na-eme ejije Nollywood, na ndị ọzọ. Apama Nolly gwara Tiwa Savage ka o jisie obi ya ike maka na ikuku a na-eku ugbua ga-akwụsị. N'okwu nke ya, Mercy Aigbe kwuru na Tiwa Savage ka bụkwa ezenwaanyị ruo echi, n'agbanyeghị asịrị na-efegharị. O kwuru na onweghị onye kacha dị nsọ n'ụwa, ma kwukwaa na ihere ga-emegbu ndị na-emetọ aha mmadụ. Daddy Freeze, n'okwu nke ya, kpọkuru ndị nkwado Tiwa Savage ka ha gosi ya nnukwu nkwado ugbua. O kwuru na onweghị onye abụghị onye mmehie, mana ihe dị mkpa bụ ka onye dara ada kulie. Ihe otiegwu a ma ama bụ Tiwa Savage na-atụ uche na ọ ga-eme dịka o meela. Ịntanet na Naijiria enwurula ọkụ dịka ihe onyonyo ọtọ nke ụfọdụ na-ebo ebubo na ọ bụ nke otiegwu Tiwa Savage na-efegharị na soshal midia kemgbe ụbọchị Mọnde. Na ịzụụka gara aga, Tiwa gbara ama na otu mkparịtaụka ya na ụlọọrụ redio mba Amerrịka a kpọrọ 'Power 105.1 na o nwere onye ji ihe onyonyo ọtọ ya amaja ya, iji napụ ya akatamkpo ego. Ọ kọwara na enyi ya nwoke amaghị ama tinye ya bụ ihe onyonyo na akara Snapchat mana o hichapụrụ ya ngwa ngwa ọ chọpụtara na ya dahiere. Mana tupu o hicha ya, ya bụ ihe onyonyo danyere n'aka ndị na-achọ ka ọ kwụọ ha nnukwu ego tupu ha ehichapụ ya. "" Agaghị m akpọ ya ihe onyonyo mmekọrịta mana ọ bụ ihe onyonyo mụ na ọdịmnobi."" ""Agaghị m enye onye ọbụla ohere iji m kpaa ego maka ihe abụghị nsọ."" Abụ m onye na-ekopu ekopu, ọ masị m e jiri m aka m wepụta ya bụ ihe onyonyo."" Mana nwaada ahụ onye tipụtara egwu ọhụru ọ kpọrọ ""Sombeody's Son"" sị na ya agaghị eme nke a. Ọ gara n'ihu rịọ ndị na-eso ya mgbaghara maka ihe onyonyo ahụ. Mana dịka o kwuchara nke ahụ, o mechara tuo ọnụ sị na ya akụọla ndị chọrọ iji ya kpa ego ahịa site na ịgwa ụwa ihe mere. Ọ sịrị, ""Obi adịghị gị mma etu m siri nara gị akụkọ ị chọrọ ji memila m kọọ, etu m si jiri akụkọ ịchọrọ iji menye m ihere kpaa ọchị n'ọgbọ."" Mana ọ dịzị ka okwu ahụ were ndị na-achụ ya iwe nke mere ka ihe onyonyo ahụ ụfọdụ na-ebo na ọ bụ nke ya gbaa n'ịntanet. Kemgbe nke a mere, ọtụtụ ụmụ Naijiria kpụzị nwaada ahụ n'ọnụ nke mere ka aha ya bụrụ ihe kachasị ewu na soshal midia taa bụ abalị 19 nke ọnwa Oktoba afọ 2021. Ụfọdụ na-akatọ ya, ebe ụfọdụ na-emetara ya ebere. N'aka nke ọzọ, ụfọdụ na-ekwu na ihe onyonyo ahụ abụghị nke Tiwa, ebe ụfọdụ na-ekwu na ya bụ akụkọ bụ akụkọ na Mike Ejeagha o ji ere egwu ya pụtara ọhụrụ. Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ etu ahụ ka akụkọ siri so egwu o tipụtaburu ọ kpọrọ 'Fever' nke wuru ewu dịka akụkọ na Wizkid tiri ya aka n'ike wuru na soshal midia oge ọ pụtara. Na otiegwu ụmụnwaanyị Naijiria abụọ a ma ama bụ Tiwa Savage na Seyi Shay nke ezi aha ya bụ Deborah Oluwaseyi Joshua kọrọ ọnụ n'ọha abụghịzị akụkọ ọhụrụ. Ha abụọ ji ogbo na ncha saa onwe ha ahụ wuru ewu na Soshal midia ụbọchị Tuzde dịka ha abụọ zutere onwe ha na mberede n'ọdọ ebe a na-eme isi dị na Lekki, Legọs. Nke bụ akụkọ bụ kedụ ihe Seyi mere meere Tiwa jiri wụọ ya n'ala na-echeghị onye nwụrụ ụzụ akwa ya na-atụ oge o kelere ya? Cheta na n'ihe onyonyo ahụ fegharịrị, Tiwa gwara Seyi dịka ọ bịara ikele ya sị, ""Jide ekele gị, echela na ị ga-eji obi ọjọọ gị bịa ikele m. ""Echezọbeghị m ihe i kwuru oge gị na Victoria Kimani tipụtara egwu afọ ole na ole gara aga."" "" I chere na m echezọzọla mkparịtaụka i nwere na-ekwu kọtọkọta maka m? "" ""Gị na nkịta ahụ tiri egwu, ga mee mkparịtaụka na-ekwụ arụ n'ọnụ maka m, o nweghị ihe m saara."" ""Edinanụghị m nwoke gị. Anapụbeghị m gị ọrụ. Aganubeghị n'ụlọọrụ redio akatọ gị."" Dịka akụkọ ihe ahụ mere n'ụtụtụ Tuzde na-afịọ, BBC Igbo jụrụ ndị ntaakụkọ ihe gbasara akụkọ ịkpa obiaṅụrị were anya ihe ha ma maka akụkọ mmadụ abụọ ahụ. Anthony Abraham, kwuru na ekworo ịdị na-etiti ndị enwe abụọ a ma ama abụghị ihe ọhụrụ maka ihe ọnụ ahụ ha kọrọ na ihe sị n'ọnụ ha abụọ pụta gosiri na ọ bụghị egwu na-esere ha"". Abraham, onye bụ onye ntaakụkọ SilverBird kwuru na ya bụ ihe ka emetụta ụlọọrụ ji ihu mndị otiegwu abụọ ahụ ere ahịa. Lee ụfọdụ ihe ha rụtụrụ aka bụ ebe mmiri si nbanye opi ụgbọgụrụ: N'egwu ahụ nke Ọ kpọghị mmadụ aha, Seyi kwuru ""onyem kpọrọ nwanne nwaanyị na -achọ ịnapụ onye m h��rụ na-anya."" N'aka nke ọzọ, Victoria Vimani kwuru maka , "" Nwa ada na-akpọ onwe ya nwada ana m ahnụ ihe mana ọ bụ nne ana ma nụ ihe."" Abraham kwuru na o teela mmadụ abụọ ahụ nwere esemokwu kama ha na-ekpu ya aka. ""Oge m jụrụ Seyi Shay ọnọdụ mmekọrịta ya na Tiwa Savage, ọ gwara m na ha enweghị nsogbu ọbụla. ""Ọ bụ nnukwu nwanne m."" ""Ihe mere bụ na ụfọdụ mgbe ọ bụ ndị na-eso onye ama ama na ndị ntaakụkọ na-akusu esemokwu n'etiti ndị na-ewu ewu."" Ihe ise Seyi Shay sara maka ebubo Tiwa boro ya Seyi Shay sara Tiwa Savage sị na ihe o merela ya akarịka mana ya gbachiri nkịtị. Na mkparịtaụka ya na ụlọakụkọ Pulse nwere n'ekwentị, o kwuru na nkịtị ya gbara abụghị na ikpe ebubo niile Tiwa Savage boro ya bụ eziokwu. Kama na ""achọghị m ịsa ya n'ihi na achọrọ m ka ihe ọ na-ekwu doo onye ọbụla anya, ọ bụghị na m amaghị ihe m ga-asa ya."" 2. Seyi Shay kwuru na ọ bụ ka ọ gachara ya elekere iri abụọ ya jiri batacha n'ụlọ ndozi isi ahụ, kelee Tiwa Savage ka ọ laghachiri bịa kọwa ya ọnụ. 3. Seyi Shay boro Tiwa Savage ebubo na ọ bụ ya na odeegwu Ceeza Milli deere egwu 'Lova Lova' bụ egwu Tiwa Savage tiri wuru ewu mana ha tiputara ya na agwaghị ya agwa ma ya fodu ikwupụta na aka ya so dị n'egwu ahụ. ""Ihe a chọrọ ịgba m ara ka m hụrụ ya. Akpọrọ m ya n'ekwentị sị ya, Tiwa, egwu 'Mr Lova Lova' ị nwaka mana achọrọ m ịgwa gị na eso m dee egwu ahụ."" 4. Seyi bokwara Tiwa ebubo ịba otu otiegwu ya na ya tikọrọ egwu ọgụ maka iso ya bụ Seyi tie egwu. 5. Seyi bokwara ebubo na Tiwa kwuburu na ọ ga-akpụpụ otu ụlọọrụ ụlọikpe ji ihu ya bụ Tiwa ere ahịa maka itinye ihu ya bụ Seyi na ihu ha ji ere ahịa. Tiwatope Savage, a ma dịka Tiwa Savage bụ otiegwu, ode egwu nakwa onye ejije A mụrụ ya na Legọs n'abalị 5 nke ọnwa Febuwarị, afọ 1980 mana ọ lara Lọndọn ka ọ dị afọ iri na otu. Ọ bụ ebe ahụ ọ gara ịgụ sekọndịrị nakwa mahadum ma malitere tiwe egwu. Egwu ndị o tiri gụnyere ""Kele Kele Love"". Ọ nọrọ n'okpuru Mavin Records nke Don Jazzy nwe tupu ọ hapụ ha afọ ole na ole gara aga. E jirila ihu Tiwa Savage ree ahịa dara ụda dịka Pepsi,Maggị, Forte Oil na MTN, Pampers na ahịa ndị ọzọ. Ọ lụrụ Tunji Balogun a ma dịka 'Tee Blizz' bụ onye na-achịkọta ya n'afọ 2013, a mụtara otu nwaa mecha see okwu gbasaa. Ezi aha ya bụ Oluwaseyi Deborah Joshua. Ọ bụ onye Naijira a mụrụ na Lọndọn n'abalị 21 nke ọnwa Disemba afọ 1985. Ọ na-eti egwu, na-ede ede ma na-emekwa ihe ejije. Efere egwu ndị o tipụtara gụnyere ""Lara & The Beat"", ""Seyi or Shay"", ""Summer Vibe"" nakwa ""Electric Package EP"". Ọ bụrụ na ị maghị egwu ya, cheta ""No Lele."" Ọ bụ onye Kenya a mụrụ n'Amerịka n'abalị 28 nke ọnwa Julai,afọ 1985. Ọ na-eti egwu, na-ede egwu ma na-eme ejije. Ọ nọpụ n'okpuru ụlọ egwu ""Chocolate City' nke Naijiria. O nwetaala nzere n'Afrịka maka egwu ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57416207 +entertainment Igbo Festivals: Ihe omimi dị n’emume Ikeji Arondizuọgụ Egwu, mmọnwụ, oriri na ọṅụṅụ na-eso mmemme Ikeji nke ndị Arondizuọgụ n'Imo steeti. N'ihe nkiri, Emmanuel Igwilo bụ otu okenye onye Arondizuọgụ kọwara ihe emume pụtara. Ndị mere ihe nkiri a bụ Ikechukwu Kalu na Chiemela peter https://www.bbc.com/igbo/48068932 +politics Russia and Ukraine conflict 2022: Etu agha Ukraine si emetụta akụnụba Naịjirịa na mbaụwa "Agha na-ada na Rọshịa dịka ndị agha mba Rọshịa na-abanye mba Yukren n'ike n'ike. Ọtụtụ mbụ ụwa anabataghị mwakpo a Rọshịa na-awakpo Yukren nke mere ka enye ha ntaramahụhụ nke a na-akpọ ""Sanctions"" n'okwu Bekee. Ataramahụhụ ga-emetụta azụmahịa mba Rọshịa nakwa ọtụtụ mba ndị nwere agba na mba ụwa. Eji mgbere ikuku gasi were mara mba Rọshịa n'ụwa niile kama mkpachị akụnụba ha metụtara mgbere gasị ha. Dịka a na-ekwu na mgbada dara ibi bụ uru dịnta, BBC Igbo jụrụ ụfọdụ ndị ọkaibe n'ihe banyere akụnụba mba na mba ihe ha nwere ikwu maka etu mba dịka Naijirịa na mba ndị ọzọ ga-esi erite uru n'agha na-ada na mba Yukren. Kachukwu Ononuju bụ onye ọkankuzi na ihe gbasara akụnaụba sị ""ọnwecheghị ụzọ ọjọọ ya bụ agha ga-esi metụta Naịjirịa, kama na ọ ga-emetụta ha n'ụzọ dị mma"". Ọ sị na Naịjiria nwere ohere ịre gasị ha ugbua maka nke ndị Rọshịa bụ nke ndị Nato chabiri okporo paịpụ ha nọ na Nostrum agaghizi na-ere ahịa gasị n'Europe. Ononuju sị na ya bụ agha ga-eme ahịa egbe na ngwaagha ga-ari elu na mbaụwa nke bụ na ndị niile na-ere ngwaagha ga-agba ezigbo akaahịa ugbua. Ọ sịkwa na ""ihe ahụ Rọshịa na-eme bụ igosi ụwa ngwaagha ha dịka ha na-ebugharị ya"". Kachukwu sịkwa na ọ bụ eziokwu na Rọshịa ga-ata ahụh�� maka mkpachị akụnaụba Nato nyere ha, nke gụnyere ịchabi okporo paịpụ ha ji ebugharị gasị akpọrọ ""Nostrum Pipeline"" Ọ gara n'ihu kọwa ""mana China nwereike nyere ha aka maka na ha bụ enyi"". Kachukwu kọwara na ọ bụrụ na ya bụ mkpachị jisie Rọshịa ike, na ha nwereike ijikwa ụzọ bụ ""Cyrpto Currency"" were zụwa ahịa site n'ụzọ zoro ezo. Otu nwamadi Igbo achọghị ka a kpọọ aha sị na ya bụ agha agaghị emetụ ahịa ""crypto currency"" n'ụzọ ọbụla ọ gwụchaa ka amalitere igba asiri ya. N'okwu ya ọ sị ""ihe ụwa kwesịrị ima bụ na asịrị ka ""crypto currency"" ji ere."" O kwusiri ike na ya bụ asịrị ga-eme ka Cryto curency rie elu. Mana o kwukwara na mba na mba maọbụ ụlọọrụ kọmpini dị ịcheịhe na ibe ya anaghị ekweta iji ""crypto currency"" azụ ahịa maka na ọ bụ ụzọ azụmahịa ọtụtụ enwetebaghi ntụkwasịobi na ya n'ihe ọ bụ ụzọ azụmahịa zoro ezo. Cryptocurrency bụ ego ịntanetị enwereike iji zụọ ahịa. A na-esi naanị n'ụzọ tekụnzụ kọmpụmta wee jiri ya zụọ ahịa. Ihe dị mkpa ịma maka ego a bụ na enweghịike inwe adịgboroja ya dịka igwe kọmpụta nke Block Chain na-echekwa usoro ya. Anaghị ejide ego Cryptocurrency n'ụlọakụ ọbụla kama ndị na-eji ya azụ ahịa nwereike isi ụzọ tekụnzụ 'Blockchain' wee zụọ ahịa ma nyefee ego site n'aka fere n'aka. Marakwana enweghi mba ọchịchị maọbụ gọọmentị ya nwereike itinye maọbụkwa nyochapụta n'uju usoro azụmahịa ya dịka ha anaghi ejikwa ego ndị mmadụ n'ụlọakụ ọbụla. Nke a mere ụfọdụ gọọmentị mba dị ịcheịche jị adọọ ndị mba ha aka na ntị ka ha hie asaa n'anya n'iji Cryptocurrency zụọ ahịa. Mba ndị nyere ịdọaka na ntị a gụnyere Naịjirịa, n'ụfọdụ mba ndị ọzọ amachịrị ya amachị. Mba ndị a gụnyere China, Algeria, Bolivia, Egypt, India, Russia wdgz. Ufọdụ ụdịrị ego a ama ama na mbaụwa bụ Bitcoin, Ethereum, Stellar na ndị ọzọ." https://www.bbc.com/igbo/60512542 +politics Ihe m ga-eme ma m bụrụ osote Gọvanọ Legọs steeti - Funke Akindele "Funke Akindele egosipụtala onwe ya dịka onye ga-azọ ọkwa osote gọvanọ Legọs steeti n'otu 'Peoples Democratic Party'. Funke kwupụtara nke a n'ụbọchị Tuzde site n'ihe onyonyo o tinyere n'akara soshal midia ya dị icheiche. O kwuru na njem ọhụrụ a ọ na-amalite bụ ""ngalaba ọzọ nke ịgbara ọha mmadụ odibo."" ""Arụọla m ọrụ dịka onye na-akpa ndị mmadụ obi ọma ihe karịrị afọ iri abụọ na ise. Chineke nyekwara m nnukwu ọganihu,"" Akindele kwuru. ""Ọ bụ ya mere na mgbe onye na-azọ ọkwa gọvanọ na Legọs steeti bụ Abdul-azeez Olajide Adediran, rịọrọ m ka m bụrụ osote ya, ahụtara m ya dịka ohere ọma iji nye aka zọpụta ma wulite ọnọdụ ndụ ndị be anyị.""" https://www.bbc.com/igbo/articles/cw83z585d54o +politics 'Structure' PDP na APC nwere bụ nke e ji ego zụta - Pat Utomi "Patrick Utomi bụ onye ọnụ na-eru n'okwu a ma ama na Naịjiria nakwa onye hibere otu National Consultative Front (NCF) na-akwado ihe a kpọrọ 'Third Force Movement', etinyela ọnụ n'okwu gbasara ọchịchị Naịjiria n'afọ 2023. Na mkparịtaụka ya na ndị ụlọntaakụkọ ChannelsTV nwere n'ụbọchị 12 Julaị 2022, Utomi bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ọkachasị ebe o metụtara akụnaụba obodo nakwa onye pati Labour, kwuru okwu gbasara ""enweghi 'structure"" bụ ihe ndị na-ama ha aka na-ekwu na pati ha enweghi. Ọ rụtụkwara aka n'ihe gbasara pati All Progressives Congress (APC) iji ndị ụka Alakụba abụọ (Bola Ahmed Tinubu na Kashim Shettima) azọ ọkwa onyeisiala na osote ya. Utomi kwuru na pati Labour ka pati abụọ kacha buo ibu na Naịjiria bụ APC na Peoples Democratic Party (PDP), nwee 'structure'. O kwuru na structure nke pati Labour nwere bụ ""nke 'kpọkịrịkpọ', ka mma karịa nke APC na PDP nwere."" Ọ gara n'ihu kwuo na pati Labour hibere isi n'elu otu ndị ọrụ bụ Nigerian Labour Congress (NLC) na Trade Union Congress (TUC), nke gbanyere mgbọrọgwụ na steeti niile dị na Naịjiria, ruo ma n'ime obodo. O kwuru sị na ha ga-enwe ihe ruru mmadụ 15 ga-akwụdoro ndị pati Labour n'ọgbọ vootu niile. O kwukwara na ha na ụfọdụ ndị pati ndị ọzọ na-arụkọ. O kwuru na ụdịrị structure APC and PDP nwere bụ ""nke e ji ego si n'akpa gọọmentị zụta"". O kwuru sị ""ụdịrị 'structure' APC na PDP nwere bụ nke 'i nye m nara gị', nke onwe, na-enweghi ike ịtụlite ọchịchị na-ahụ ebe Naịjiria na-aga ma gbaa mbọ ịhụ na Naịjiria garuru ebe ahụ."" Ọ gara n'ihu kwuo na ihe mere e ji kpụrụ 'structure' n'ọnụ bụ maka na ntuliaka na Naịjiria na-adabekarị n'ịghọ aghụghọ na igobi vootu. Utomi kwuru na ọ bụ ntozuoke kacha mkpa, na ""ndị mmadụ na-aka anọsapụ ahụ n'ọgbakọ ọbụla ma ọ dị ha ka a na-ebu ọdịmma ha n'uche na mkpebi ọbụla a na-eme."" A jụrụ ya ihe mere na 'Muslim-Muslim' tiketị adịghị mkpa na ntuliaka afọ 1993 oge MKO Abiola na Babagana Kingibe ji ya zọọ ọkwa, ma bịa bụrụ ihe a kpụ n'ọnụ n'afọ 2023. Ọ zara sị: ""E nweela ajọ nkewa na Naịjiria ugbua karịa etu ọ dị n'afọ 1993. ""Nke abụọ, ụdịrị mmadụ Abiola bụ dị iche n'ụdịrị ihe a na-ahụ ugbua. Akparamagwa ya dị iche n'ụdịrị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndị nke na-ejizi ofufe eme nkewa e ji azọ ndọrọndọrọ ọchịchị.""" https://www.bbc.com/igbo/articles/c987z47xevlo +entertainment Alex Ekubo na Fancy Acholonu agbasaala n'ezie "Onye na-egosiputa akwa Fancy Acholonu na Alexx Ekubo bụ omeiheonyonyo nke Nollywood agbakeela n'ezie. Cheta na ha abụọ kwụsịrị i so onwe ha n'igwe soshal midia dịka ọ pụtara ihe n'ụbọchị Wenzde. Ha abụọ wepụkwara akara Instagram ha jikọrọ ọnụ mepee. Fancy gbara nkewa ha n'anwụ n'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya n'ụbọchị Tọzde. Nke a na-abịa naanị onwe ole na ole tupu agbamakwụkwọ ha nke a na-ele anya na ọ ga-abụ n' abalị 20 nke ọnwa Novemba, afọ 2021. O nweghị onye ma ma o nwere okwu na-esere mmadụ abụọ ahụ dịka Alex azaghị ekwentị ya oge BBC Igbo kpọrọ ya n'ekwentị nke ọ na-asa ozi anyị zigara ya. O wuru ewu na soshal midia ọnwa ole na ole gaara aga oge Alex Ekubo mara ọkwa na ya enweela onye ya na ya kwere onwe ha nkwa alụmdinanwunye. Naanị izu ole na-ole gara aga, mmadụ abụọ ahụ bụ ahụghị-ma- erighị dịka ha abụọ na-egosịrịta onwe ha ịhụnanya na soshal midia. Iji maa atụ, izuụka atọ gara aga oge Alex tinyere foto were na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha gbaara akụkọ ọjọọ ọsọ, na ọ na-emebi ahịa, Fancy Achọlọnụ bere ebe ahụ dee n'asụsụ French sị, ""Ị maka,ọ dị m ka m susu gị ọnụ ugbua"". Ọzọ, na nso nso a, o wepụtara ihe onyonyo ebe ọ na-agba egwu n'emume ncheta ọmụmụ ya ma kwuo yna ya na nwoke ọzọ agaghị agba ekwu n'ihi na ya alụọla di. Alex Ekubo Alex Ekubo Okwaraeke bụ onye ihe ejije Nollywood a na-anụ aha ya. Ọ bụ onye e ji ahụ ya ere ahịa nke Bekee kpọrọ 'model' ma bụrụkwa onye gbara onye nke abụọ n'asompi nwoke Naijiria kacha mma nke a kpọrọ ""Mr Nigeria"" Onye Arochukwu dị n'Abia steeti, mana a mụrụ ya na Legọs. Ihe ejije ndị o merela gụnyere: Lagos Cougars,Tinsel,Ladies Men wdg Fancy Acholonu Fancy Chigozie Acholonu bụ nwa ada Igbo a mụrụ n'Amerịka Ọ gụrụ 'Business Administration' na mahadum Ọ bụ onye na-eme ihe ejije, ojiegoachụego nakwa onye e ji ahụ ya ere ngwaahịa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58321611 +politics Ebelechukwu Obiano: Onye bụ nwaanyị ụwa kpụ n'ọnụ? Nwunye Willie Obiano, aka chịchapụrụ Anambra steeti bụ Ebelechukwu Obiano bụ onye a kpụ n'ọnụ ugbua a na Naịjiria. Nke a bụ n'ihi agwa ọ kpara mgbe o bu nsogbu gakwuru Bianca Ojukwu n'emume nnyefe ọchịchị na idu n'iyi ọrụ nke Gọvanọ Chukwuma Soludo, e mere n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị 2022. Mana e wepụ ya bụ esemokwu mere ka o wuo na Naịjiria nakwa na soshal midia n'ụbọchị ahụ, e nwere ihe ndị kwesịrị ka a mara maka nwaanyị a bụbu Nwaanyị Mbụ n'Anambra steeti site n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị afọ 2014 ruo 17 nke ọnwa Maachị 2022. Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ya: https://www.bbc.com/igbo/afirika-60791495 +entertainment Mercy Chinwo: Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ị na-amaghị maka nwa ada a "Alumdinwunye Mercy Chinwo bụ oti egwu ụka ama ama na Blessed Uzochikwa bụ ụkochukwu otu ụlọụka dị na Lagos na-ewu na soshal media nke ukwuu. Chinwo na kwuputere na ya ekwetala ịlụ Uzochikwa n'ọnwa June. Chinwo wepụtara foto ole na ole ya na Uzochikwa sere iji gosi ụwa na ha kwadola ịlụ onwe ha n'ọnwa June, 2022. Kamgbe ahụ ha ji emume ịgba nkwụ, agbamakwụkwọ nke ụlọikpe nakwa nke ụlọụka sochie nkwuputa ahụ anya. Nke a mere ka ndị mmadụ kpụrụ ha n'ọnụ Mercy Chinwo bụ onye na-eti egwu ụka na Naịjirịa ama ama. N'ajụjụ ọnụ a gbara ya n'afọ 2012 mgbe o meriri nturugo ""Nigerian Idol"", Chinwo kwuputere ihe ndị a maka onwe ya." https://www.bbc.com/igbo/articles/czqp23zveleo +politics Ipob Referendum: Akọ na uche ka ndị Igbo ga-eji nweta ihe ha chọrọ - Ọhaneze Na mkparitaụka ya BBC Igbo nwere agba nke abụọ ya, Nnia Nwodo kọwara etu e nwere ike isi mee ka referandum dị ire. O kwukwara na itu aro ka mma karịa iji obi ọkụ eso ya bụ okwu. Gee ihe o kwuru n'uju: https://www.bbc.com/igbo/media-47042617 +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Mikel Obi na Kelechi Iheanacho kwuru na ha mara Ingland nke ọma Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Nnukwu ụgbọala akwọriela nwaanyị ku nwa na mmadụ isii ndị ọzọ n'Owerri Otu nwaanyị ku nwa n'aka na mmadụ isii ndị ọzọ etufuola ndụ ha n'ihe mberede okporoụzọ mere n'Owerri. Ndị ọrụ nchekwa FRSC kwuru na nchọpụta ha na-atụ onye kwọ nnukwu ụgbọala kụrụ ụgbọala mmadụ iri na isii si Ọnịcha nọ n'ime ya. Naịjirịa Ndị ọchịehi a ga-abụ otu na-eyi ọha egwu ka ha agahị abụ? Ụlọikpe etiti nọ n'Abuja ga-amalite ụbọchị iri na abụọ ọnwa Juunu ileba anya ka a ga-akpọ ndị ọchịehi otu na-eyi ọha egwu. Ọ ga-elebakwa anya n'akwụkwọ e degara ya ka ha kwụsị ndị ọchịehi ịchụ ehi na Benue steeti maka mkpamkpa ha na-akpa eba ahụ. Ebe ọzọ na Naịjirịa Ọgbaghara mere n'APC Ekiti steeti chọrọ ịta isi Fayemi. Otu APC ekwuola na ọgbaghara mere n'Ekiti bụ onye bụbu gọvanọ steeti ahụ bụ Kayode Fayemi ka a chọrọ igbu. Fayemi hapụrụ ọkwa ya dịka mịnịsịta na-ahụ maka ngwụputa ịga zọọ gaọvanọ ọzọ n'Ekiti. Akụkọ mba ofesi Kenya chọrọ ịhụ na ndị ọrụ ha niile bụ ndị na-ekwu eziokwu. Onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta ekwuola na ndị na-achọ ọkwa ọchịchị na gọọmenti ya ga-agafe mashine na-enyocha asị. Kenyatta kwuru na nke a bụ iji nyochaa ndị ọrụ ha maa chụkwa mpụ ọsọ. N'egwuregwu, Naịjirịa na Ingland ga-akwata ya na ọgbọ Wembley taa. Dịka Naịjirịa na Igland ga-agba asọmpi enyi na enyi taa, Mikel Obi na Kelechi Iheanacho kwuru ka a wụsara ha ọwara maka ya bụ asọmpi. Ha kwuru na nke a bụ maka na ha mara mba Ingland nkeọma ebe Mikel gbaburu Chelsea ma Iheanacho na-agbara Leicestere City bọọlụ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa: https://www.bbc.com/igbo/44340801 +business Okporoụzọ ahịa Ariaria na-akawanye njọ - Ndị ahịa Ndị na-azụ ahịa n'arịarịa dị n'Aba Abia Steeti arịọla gọọmentị ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka. Ọ bụghị taa ka ndị na-azụ ahịa ebe ahụ na ajọ ụzọ na ihe ndị ọzọ na-agbarịta mgba. Kama ugbua mmiri bidoro izo ihe ka nte abịakwutela nte n'ọnụ ya. Ihe onyonyo na-egosi ọnọdụ ahịa augbua Lee kwa ihe gọọmentị sara ha. https://www.bbc.com/igbo/articles/ckvx59d7lwzo +health Coronavirus in Africa: 'Ebumnobi m bụ ịhụ na ụmụnwaanyị di ime agaghị na-enwe nchekasị' "Dkt Jemimah Muthoni bụ dọkịta ọmụmụ nwa na mba Kenya ekwuola etu o si enyere ụmụnwaanyị dị ime aka ọkachasị n'oge coronavirus a. Muthoni na-arụ n'ụlọọgwụ Kenyatta National n'isi obodo Nairobi, kọwara etu o si malite atụmatụ ọ kpọrọ ""Wheels For Life"". Ọ kọwara etu ozi o zipuru na Twitter nke wuru ewu si bido atụmatụ a. Atụmatụ ahụ na-enye ụmụnwaanyị ime na-eme maọbụ ndị nwere gbatagbata ọbụla n'abalị gbasara afọ ime ha maọbụ nwa ha, ohere ịnweta ụgbọala njem. O kwuru na ebumnobi ya bụ ịhụ na ụmụnwaanyị di ime agaghị na-enwe nchekasị." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53126268 +politics Peter Obi: Achọrọ m ka a tụnyere m n'ihi na m ma ihe ekwe na-akụ, ọ bụghị maka ebe m si "Onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naijiria n'aha otu 'Labour Party' bụ Peter Obi ekwuola ihe mere o jiri họrọ Yusuf Datti dịka Osote ya na ntuliaka 2023. Obi kwuru na mkparịtaụka ya na BBC nwere na ihe mere ya jiri họrọ Yusuf Datti ka ọ bụrụ osote ya bụ na ""anyị enyochara Datti, hụ na o tozuru ihe a chọrọ iji gbanwee ọnọdụ Naijiria"". O kwuru na ebumnobi ya bụ igbo nsogbu enweghị nchekwa na ịdọpụta ụmụ Naijirria n'ụbịam. N'okwu ndị na-akparị ndị mmadụ na soshal midia n'ihi ya, Obi kwuru na ọ bụghị nani ndị na-akwado ya na eme nke a, ""ụfọdụ ndị na-akparị ndị mmadụ na soshal midia bụ ndị na-azọsara m ọkwa onyeisiala gobiri ha iji mebie aha m"". N'okwu agbụrụ na okpukperechi, Obi sịrị na "" achọghị ka a tụnyere n'ihi na m si na Ọwụwa Anyanwụ, achọrọ m ka a tụnyere m maka nka nwere ime ka Naijiria dị mma. Ọ bụghị n'ihi ebe m si"". Ọ kọwara na ya bụ mmadụ okwu ọdịmma Naijiria na-anọ ya ọkụ n'obi. Cheta na Obi bụ aka chiburu Anambara steeti si na otu PDP banye Labour party tupu ntuliaka imeụlọ PDP bụ ebe o nwetara ikike ịzọ ọkwa onyeisiala n'aha pati ahụ. Kemgbe ahụ, aha ya na-ewu na soshal midia dịka ọtụtụ ndị ntorobia kpụ ya n'ọnụ n'ihi olileanya ha na ọ bụ ya ga-agbanwe ọnọdụ akụnaụba Naijiria na-adakpo n'ihi tigbuo zogbuo na ụbịam." https://www.bbc.com/igbo/articles/crgvxpx8rego +sports Bournemouth vs Chelsea: Mmanya ngwọ ndị Chelsea agbọghị ụfụfụ na be Bournemouth "Dịka ndị otu Chlesea na-agba mbọ ihụ na ha sọ n'agba nke mbụ n'asọmpị Premiership ka ndị AFC Bournemouth chọrọ itinyere ha aja n'garri. Ọ bụ na nkeji nke iri atọ na asaa ka Marcos Alonso nke Chelsea nyere goolu nke mbụ dịka ọ jiri shọtụ Giroud nke kụrụ n'baa were takaa netị ndị Bournemouth. Cheta na ọ bụ Alonso achụpụrụ mgbe ha na Bayern Munich zutere nsonso a nyere goolu a. N'agba nke abụọ ka Jefferson Lerma nke Bournemouth sahachịrị goolu ndị Chelsea. Ọ bụ kọna Fraser gbara ka Lerma jiri were isi mee Caballero ""ọ nọ nso eruaka"". Dịka ndị Bournemouth egbughị oge mgbe ha nyere goolu nke abụọ na nkeji iri anọ na isii. Ndị Chelsea chere na ọ bụ 'offiside' mana VAR siri na ọ bụ goolu. Chelsea gbalịrị ike ha nke mụtara mkpụrụ dịka Alonso gosi kwara na ọ bụ ọkaibe dịka o nyere goolu nke abụọ na nkeji iri asatọ na ise. Chelsea ka bụ kwa ndị agba nke anọ na tebulu ebe ndị Bournemouth nọ n'agba nke iri na asaa." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51691498 +politics Anambra Governorship Manifesto: Nkwa ndị na-azọ ọkwa gọvanọ na-ekwe ndi Anambra Nkwa ụfọdụ ndị na-adọ ndọrọndọrọ ọkwa gọvanọ Anambara Steeti kwere ndị Anambara. Ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ pụtara kwuo ebe ha ga-esi rụọrọ ndị Anambara ọrụ ma ha nwete ọchịchị. https://www.bbc.com/igbo/afirika-59041824 +sports Aston Villa v Man City: Man City ejirila nkata bunye Villa goolu na be ha Otu Manchester City emeghiri Aston Villa ebere dịka ha ji nkata kponye ha ọkpụ goolu isii. Villa gbalịrị ịnyeghachi ha mana ha gbanyere naanị otu ọkpụ na ngwụcha asọmpị ahụ. Mahrez nyere goolu abụọ mbụ na nkeji 18 na 24 ma Aguero so ya n'azụ site na nke o nyere na nkeji 28. Na oge etinyesoro n'agba nke mbụ, Gabriel Jesus nyere otu ọkpụ na nkeji 46. Dịka amalitere agba nke abụọ, Aguero nyekwara ọkpụ abụọ ọzọ na nkeji 57 nakwa 81. Ndị uweojii anwụchiela ụmụ nwoke na-ezu ọbante ụmụnwaanyị Ndị uweojii na Legọs anwụchiela ụmụ nwoke ise maka ị zuru ọbante ụmụ nwaanyị na gburgburu ebe ha bi n'Ọjọ. Otu n'ime ha bụ Chukwujaekwu EzeIgbo kwuru na o ruola otu afọ kemgbe ọ na-akpa mkpa mkpa a. Ndị ahụ a nwụchiri kwuru na ọ bụ ọgwụ ego ka ha ji ọbante ndị a agwọ. N'aka ọzọ Ndị agha Naịjirịa ekwuola na atụmatụ ha kpọrọ Handarin Daji ataala isi n dị ohi ruru otu narị na Zamfdara nakwa Katsina steeti. Ha kwuru na agbagburu ndị a n'ogige ebe ha na-ezo site n'ọnwa Disemba rue ọnwa Jenụwarị afọ a. Na mba ofesi, Ezenwaanyị mba Briten bụ Elizabeth akpọọla nzụkọ gbatagbata ezinaụlọ ya n'obieze Sandringham iji kpa maka okwu Ọkparaeze Harry na nwunye ya Meghan. Cheta na ọ bụ abalị ole na ole gara aga ka Harry na nwunye ya Meghan kwuru na ha ga-akwụsitụ ọrụ dịka ndị ezinaụlọ Ezenwaanyị ma malite ịkpata ego nke ha. N'egwuregwu, Watford ejirila ọkpụ goolu atọ fọjuo otu Bournemouth ọnụ dịka Aston Villa na Man City na-akwata ya ugbua ịji ma mbe na abọ nke bụ oke n'asọmpị Premier Lig. Gee nkeji ebe a Ndị nchekwa Iran nwụchirị onye nnọchite anya mba Briten bụ Rob Macaire na ebubo na ọ chọrọ ibido ọgba aghara mgbe ọ biara ọgbakọ ịmu anya maka ndị nwụrụ n'ụgbọelu Iran gbaturu. Kama Macaire si na ọ bụ asị ma sị na ya apụọla tupu ọgbakọ ọha ahụ aghọrọ ngaghari iwe. O kwuru na ya gara ya bụ imu anya mgbaru maka n'ọbụ ihe ziri ezi ma tinye kwa na ụfodụ ndị nwụru bụ ndị mba Briten. Ndị mba briten gbarụrụ ihu ma sị na njichi ejichiri onye nnọchite anya ha megidere iwu ụwa niile n'ihi na ekwesighị inwụchi onye nnọchite anya obodo ọbụla. Ndị nchekwa Iran nwụchịrị ya ma jichie ya ihe ruru awa atọ. Cheta na Iran ka na-aza ụgba maka ụgbọelu ndị mba Ukraine ha ji ogbunigwe gbatuo. Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buahrị ezigarala ndị Anambra na ndị ezinaụlo ode Akwụkwọ bụ Chukwuemeka Ike ozi iti aka n'obi maka ọnwụ ya . Ọ bụ onye ndụmọdụ gọọmentị n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Femi Adesina depụtara nkea ma sị na ọnyeisiala bụ Buharị sị na a ga-echeta Chukwuemeka Ike maka ọrụ ya n'imepe obodo na-ihu na ndị ntotoobia nwetere ezigbo ọzụzụ. Otutu ndị mmadụ apụtala n'igwe ha n'isi obodo Iran bụ Tehran ime ngagharị iwe megide ndị ọrụ gọọmentị tubụrụ asị mgbe ha sị na ọbụghị ha gbaturu ụgboelu mba Ukraine. Ọ bụ na Mahadum abụọ ka emere ngagharị iwe a ebe onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwadoro ha ma sị na ngaghari iwe ha na akwalite mụọ. Serena Williams onye dị afọ iri atọ na asato ji merịa were mee ya mmerị asọmpị Tenịs nke iri asaa na atọ ya. Wlliams kwuru na ya ga-enye ego o ritere na mmeria na uwe oyi were zọo asọmpị ahu maka inyere aka maka ọkụ na-agba na mba Ustrelịa. Ọ ka apụtakwa n'ọgbọ dịka ya na Caroline Woziniacki ga-ezute Asia Muhammad na Taylor Townsend na agba nke ikpeazụ nke mmadụ abụọ. Dịka ndị otu egwu bọọlu liverpool ji otu ọkpu goolu were merie ndi nke tottenham, onye ndụ ha bụ Jurgen Klopp na akowa na na-agbanyeghi na ha ji akara iri na isii were buru eze na Premiership, na ọ naghị aba ha anya tutu ha ebulie iko premiership. https://www.bbc.com/igbo/afirika-51081947 +entertainment Zack Orji: Anaghị m ebi ndụ na soshal midia Zack Orji bụ onye ejije Nollywood a ma ama bụ onye ọtụtụ kpụ n'ọnụ ugbua na soshal midia. Orji ekwuola na ya anaghị ebi ndụ nke ya na soshal midia. O kwuru na soshal midia na-anapụ ndị mmadụ oge ha kwesịrị iji mee ihe dị mkpa. Orji kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n’afọ 2020 oge ọrịa Covid-19 ji ọgbọ na Naijiria nke mere ka gọọmentị tinye mmachi ngagharị ndị mmadụ. Orji bụ e chiri ụkọchukwu n’ụka ‘Powerline Bible Church’ kwuru na ọrụ ịgbasa oziọma Kraịsti ebugala mba dị iche iche na Naijiria, n'Alabekee nakwa ụfọdụ mba n'Afrịka. N'okwu etu o siri malitere ọrụ ime ejije, o kwuru na ọ bụ ọrụ igo ihe ubi ma na-ebupụ ya ka o nwetara ohere isonye n’ejije. Kirie ya n'uju. https://www.bbc.com/igbo/articles/cnkzly33l1go +health Covid-19: Nwaafọ Naịjirịa na-agba bọọlụ ebutela Coronavirus "Otu nwaafọ Naijirịa aha ya bụ King Paul Akpan Udoh ebutela ọrịa CoronaVirus. Udoh na-agbara ndị otu Pianese na 'Serie C' ndị mba Itali. Dịka ọ dị ụgbụa, ewepụla ya si n'ebe ọha nọ pụọ nke bekee na-akpọ ""Quarantine"". Akụkọ na-ekwu na enwere mgbe ndị otu Juventus Chọburu ịgote ya mana ọnweghị isi. Ndị egwuregwu bọọlụ na-atụ ụjọ na enwere ike ị sị ha sọo asọmpị n'ebe ha nwereike ibute oria a. Mana ka ọ dị ụgbụa, eyiharịala ụfọdụ asọmpị nke dịka AFC Champions league maka ọrịa Coronavirus. Onyeisi ndị ụka Katọlik na Legọs bụ Adewale Martins amachiela inyerịta ekele nke udo n'oge mass. Nke a bụ otu ụzọ iji kee nkwụcha ma belata mgbasa ọrịa coronavirus. Bishọp Adewale Martins kwupụtara nke a n'ime akwụkwọ ozi o zipụrụ na mgbede Fraịde. Chetakwa na a kwụsịkwara inye ekele nke udo oge ọrịa Ebola malitere n'afọ 2014. Oge ekele nke udo bụ oge ndị mmadụ ji ekelekọrịta ibe ha n'oge a na-aka ụka. A na-eme ya iji gosi ihụnanya na ịdịkọn'otu n'etiti ndị otu Kristi. Bishọp Martins kwukwara na ọgbakọ ngagharị nke obe (stations of the cross) bụ nke ndị Katọlik na-eme ụbọchị abụọ n'izuụka ọbụla, ga-abụzị sọ otu ụbọchị. A na-emekarị ngagharị nke obe kwa Wenezde na Fraide ọbụla n'oge lent, ugbua, ọ ga-abụzị sọ n'ụbọchị Fraide. Ndị Arsenal ebejuola efere n'akwa dịka ndị Olympiakos ji nke a kpọrọ 'away goal rule' gbapụ ha n'asọmpi Europa League n'abalị. N'agbanyeghi otu goolu o nyere na nkeji 113, Pierre-Emerick Aubameyang bụ onyendu ha riwara agba dịka nkeji e ji egbuchi bọọlụ ruru, nke kpọnyere ntu n'akpati e ji bupu ha na ya bụ asọmpi. Ndị Olympiakos na onwe ha si n'aka Pape Abou Cisse na Youssef El Arabi nye goolu abụọ so mee ka mmeri ha zuo oke. Cheta na Arsenal jibu naanị otu goolu merie ha n'ụlọ ha mgbe ha zuteburu. Ka ọ dị ugbua, olileanya Arsenal nweburu isi ụzọ a mara ma ha a ga-enweta ohere ịbanye na Champions League nke afọ 2020/21, enweghizi isi. Chetakwa na ha ruru n'agba ngwụcha n'asọmpi a n'afọ gara aga, mana Chelsea sepụrụ ha ara n'ọnụ iji bulie iko a. N'otu aka ahụ, Odion Ighalo bụ nwaafọ Naịjirịa nyere goolu mbụ ya dịka onye Man United, ka ha ji ọkpụ goolu ise asaghị asa sụjuo Club Brugges afọ. Coronavirus nọ na Naịjiria Osagie Ehanire bụ minista na-ahụ maka ahụike na Naịjiria agwala ọha okwu, ebe ọ na-asị ndị mmadụ dere jụụ n'ihe gbasara mbata ọrịa coronavirus na Naịjirịa. Ọ gara n'ihu sị na ha ekeela nkwụcha n'ihe gbasara ibuso ọrịa a agha, mana gwa ndị mmadụ ka ha na-edebe onwe ha na gburugburu ha ọcha. Gụọ ihe o kwuru n'uju ebe a: Gọọmenti Nigeria ekwuola okwu maka Coronavirus Ihe onyeisiala Saụt Afrịka na-eme maka Coronavirus Cyril Ramaphosa bụ onyeisiala mba Saụt Afrịka enyela iwu ka a kpọlata ihe ruru mmadụ otu narị na iri atọ bụ ndị mba ha bi n'obodo Wuhan dị na Chaịna bụ ebe ọrịa coronavirus a na-enye ụwa nsogbu malitere. Ka ọ dị ugbua, mmadụ abụọ bụ ndị mba Saụt Afrịka na-arụ n'elu ụgbọmmiri e jidere mmaka nnyocha ọrịa a na mba Japan, eburula ya bụ ọrịa. Etu coronavirus si metụta ahịa mbaụwa Ụlọahịa ndị achụmntaego nke a kpọrọ stock market na Bekee na ha akpụ afọ n'ala na mpaghara mbaụwa gụnyere Ọstrelia, Briten, Jamini, Frans nakwa mba Amerịka. Ọ kacha mpaghara Eshia dịka Japan, India, Hong Kong, Shanghai dị na Chaịna nakwa Seoul dị na mba Saụt Koriya. N'egwuregwu, A ga-ama ma nwaafọ Naịjirịa bụ Wilfred Ndidi ọ ga-eso ndị Leicester City gbaa bọọlụ taa dịka ha ga-ezute ndị Norwich taa. Cheta na a wara ya ikpere ka ọ merụchara ahụ. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51665153 +politics Governor Andrew Cuomo nke New York agbaala arụkwaghịm n'ebubo ịkpa ụmụnwaanyị aka n'ụbọ "Gọvanọ New York bụ Andrew Cuomo nọrọ ụbọchị Tuzde tinye akwụkwọ arụkwaghịm dịka gọvanọ New York dịka ebubo ịkpa ụmụnwaanyị aka n'ụbọ eboro ya na-arị elu. N'ozi ọ gbasara n'ihe onyonyo TV ụbọchị Tuzde, Cuomo sịrị, ""Dịka ihe sịrị kwụrụ, ihe kacha mma ka m mee bụ ịkwụrụ na ụsọ, ka ọchịchị gakwa n'aka gọọmentị, ya mere, nke a bụ ihe m ga-eme n'ihi na ọ bụ ụnụ ka m na-arụrụ ọrụ, ime ihe kwesịrị bụ imeere ụnụ ihe kwesịrị."" Cuomo ekweghị asaa ndị ntaakụkọ ajụjụ ka o kwuchara nke a. Ka ọ dị ugbua, Osote ya bụ Kathy Hochul, onye 'Democrat', bụ onye ga-anọzi n'ọkwa Cuomo dịka gọvanọ malite n'abalị 14 na-abịa bụ oge arụkwaghịm Cuomo ga-amalite dịwe ire. Cheta na nsonso a nnyocha e mere kwuru na ụmụnwaanyị ruru 11 boro Cuomo ebubo ịkpa ha aka n'ụzọ ekweghịghị ekwesị mana Cuomo gọrọ agụghọ na ọ bụghị eziokwu. Cuomo leburu anya na nnyocha ahụ nke o nyere ọkaiwu steeti ahụ bụ Leticia James ka o mee ga-ekwu n'aka ya dị ọcha mana James mechara nnyocha sị na Cuomo meere ihe e boro ya n'ebubo. Onyeisiala Mba amerịka bụ Joe Biden akpoola gọvanọ New York bụ Andrew Cuoma okpu ka otinye akwụkwọ arụkwaghị maka ebubo ịkpa ụmụnwaanyị aka n'ụbọ. Nke na-eso nnyocha e mere gosiri na Cuomo dara iwu nke gọọmentị etiti nakwa nke steeti,n'ihe gbasaara imekpa ụmụnwaanyị ahụ n'ụlọọrụ site na ịkpa ha aka n'ebe ekwesịghị. Ọ bụghị naanị Joe Biden, ndị ọzọ welitere isi dịka Chuck Schumer bụ onye ndu Ụlọomeiwu Ukwu mba Amerịka nke Bekee kpọrọ ""US senate majority leader' nakwa Senetọ Kirsten Gillibrand etinyela ọnụ. Ha abụọ bụkwa ndị otu ""Democrats' bụ pati Cuomo nọ na ya katọrọ Cuomo ma kpoo oku ka o tinye akwụkwọ arụkwaghị. Mana Cuomo gọrọ, kwuo na ebubo ndị a bụ okwu ""ndọrọndọrọ ọchịchị"" nakwa ""ile anya n'ihu ekwu okwu"". Ọkaiwu Steeti New York ekwuola na nnyocha e mere gosiri na gọvanọ steeti ahụ bụ Andrew Cuomo akpaala ọtụtụ ụmụnwaanyị aka n'ụzọ na-ekweghị ekwesị, susuo ụfọdụ ha ọnụ maọbụ gwa ha okwu dịbara aghaa. Letitia James, onye gwara ndị ntaakụkọ nke a ụbọchị Tuzde sịrị na nnyocha emere agbaala n'anwụ mkpagbu nwere ike ịdị n'ebe ndị nwere nnukwu ọkwa nọ. Cheta na n'ọnwa Maachị 2021, Cuomo sịburu 'ndo"" maka ime ụmụnwaanyị ihe mere ha ka ha ghara ịnọkwata mana ọ gọrọ na o nweghị onye ya metụrụaka etu ekweghị. Na nsonso a, ụmụnwaanyị atọ pụtara na-ebo ya ebubo ịkpasa ha agwa dị aghaa. Otu nwaanyị bụ onye enyemaka gọvanọ bụ Lindsey Boylan, boro ebubo na Cuomo susuru ya ọnụ n'egbugbere ọnụ ma gwakwa ya bịa gbara ọtọ gbara ya egwu na ụgbọelu ya. Onye ọzọ rụburu Cuomo ọrụ bụ Charlotte Bennett, gwara ụlọakụkọ New York Times na gọvanọ na-ajụgasị ya ụdị ajụjụ nke gosiri na ọ chọrọ ka ya na ya dinaa. ""O kwere m ghọta na gọvanọ chọrọ ka mụ na ya dinaa."" Otu nwaanyị onye ose foto bụ Anna Ruch, kwuru na Cuomo metụrụ ya aka n'ihu sị ya susuo ya ọnụ n'otu mmemme agbamakwụkwọ Mana Cuomo onye kwuru na ya agaghị agba arụkwaghịm maka ebubo ndị ahụ, gwaburu ndị mmadụ gbaa jim , ka e mechaa nnyocha tupu ha kpebie. Kedụ ihe Cuomo kwuru n'ozi ịrịọ mgbaghara o wepụtara? Dịka ndị mmadụ na-akpo oku ya tinye akwụkwọ arụkwaghịm, Cuomo sịrị na ịmakụ mmadụ na isusu ha ọnụ bụ ""ụzọ ya si ekelekarị ndị mmadụ"" ya mụtara n'aka nna ya, bụkwa aka chiburu New York bụ Mario Cuomo. O kwuru na n'ezie na ihe agbanweela na ya mụtara akọ n'ihe mere. ""Echiche m adịghị mkpa. Ọ bụ na ọdịghị ụmụnwaanyị mma, ị mara na ọ dị njọ. Ọ bụrụ na o mejọrọ ha, ana m arịọ mgbaghara.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-58076709 +entertainment White Money Big Brother: Whitemoney amaburula N90m n'egwuregwu Big Brother Naija 2021 White Money nke pụtara 'ego ọcha' n'asụsụ Igbo emeriela asọmpị Big Brother nke afọ 2021. Nke a pụtara na ọ ga-eji ego ruru nde iri itoolu, ụgbọala nakwa onyinyi ne ihe nrite ndị ọzọ laa bee ya. Asọmpị a bụkwa emume malitere kemgbe ọnwa Jụlai bịara na njedebe n'abalị ụbọchị atọ nke ọnwa Ọktoba. - Ezi aha ya bụ Hazel Onyeze Onou - Ọ bụ onye Enugwu steeti - A mụrụ ya n'ọnwa Jụlaị afọ 1992 - Ọ bụ onye mmeri eguregwu Big Brother nke isii Ihe ndị e ji mara ya gụnyere: ịkpụ isi, ịti egwu, ise foto na ịdozi ịgwe ọkụ Emume Big Brother Naija nke afọ 2021 malitere n'abalị Satọdee, ụbọchị iri abụọ na anọ nke Julaị. Ha dị mmadụ iri na otu nọ n'ụlọ Big Brother nke afọ a, n'ime ha, mmadụ abụọ bụ ndị Igbo. Aha mmadụ abụọ a bụ Hazel Oyeze Onou (White Money) onye Enugwu steeti, na Ikechukwu Sunday Okonkwo (Cross) onye Anambara. Lee ụfọdụ ndị so n'egwuregwu Big Brother Naija 2021 White Money Ezigbo aha ya bụ Hazel Oyeze Onou White Money bụ otu n'ime ụmụ afọ Igbo abụọ so n'emume Big Brother Naija nke afọ a. Ọ bụ Enugwu Steeti ka o si, mana o bi na Legọs. Ọ dị afọ iri abụọ na itoolu (29). Aha a bụ 'White Money' pụtara ego ọcha n'asụsụ Igbo, mana ọ bụ okwu bekee nke pụtara ego mmadụ kpatara n'ụzọ ziri ezi. Nwa amadị a kọwara onwe ya dịka onye o ji ego achụ ego. Ọ na-azụ ahịa akpụkpọ ụkwụ bụ nke ọ na-esi mba ofesi atụbata na Naịjirịa. Ihe mere aha ya ji ewu Ikechukwu Sunday Okonkwo Nwa amadị a dị afọ iri atọ bụ onye oji ego achụ ego nke bekee na-akpọ 'entrepreneur'. Ọ bụ ya bụ onye Igbo nke abụọ nọ n'ụlọ Big Brother Naija 2021, mana o bi na Legọs. Ihe na-amasị ya bụ ikiri ejije, ime njem na ịga ụlọ egwu (clubbing). Ọ kọwara onwe ya dịka onye nwere ezigbo obi, n'agbanyeghị na ụfọdụ na-ahụta ya dịka ajọ mmadụ. Pere Egbi Ọ bụ nwa afọ Delta steeti, a mụrụ ya na Warri. Pere bụ nọọsụ a zụrụ nke ọma, ma rụkwaa ọrụ n'otu ndị agha nke mba Amerịka ihe ruru afọ isii. Ugbua, ọ bụ onye na-eme ejije nakwa 'model'. Ọ dị afọ iri atọ na ise (35). Yousef Garba Yousef bụbu onye nkuzi ụlọakwụkwọ Sekọndịrị ma bụrụkwa 'model' Ọ bụ onye Jos, Plateau Steeti mana otu n'ime nne ya maọbụ nna ya abụghị onye Naịjirịa. Nri na-amasị nwa amadị a, mana ọ hụkwara ịgụ akwụkwọ, ịrị ugwu, ime njem nakwa egwuregwu 'sports' n'anya. Boma Akpore Ọ dị afọ iri atọ na anọ ma bụrụkwa onye gbaburu bọọlụ mechaa kwụsị. Boma kwuru na ya kwụsịrị mahdaum oge ọ nọ n'afọ nke ikpeazụ n'ihi na ego adịghị, mana o mechara gbaa mbọ nweta ego o jiri gaa ụlọakwụkwọ na-enye ọzụzụ maka ejije. Nwa amadi a alụbuola nwaanyị mana ọ dabaghịrị ya na nwunye ya ha wee gbasaa. Ọ na-eme ihe ejije, ma bụrụkwa onye na-arụ ọrụ ebe a na-ere mmanya (bartender). Adeniyi Lawai Lawai, nwa afọ Oyo steeti alụọla nwaanyị ma mụta otu nwa. Ọ dị afọ iri atọ na atọ (33), bụrụkwa onye nwetara ọzụzụ dịka 'computer engineer'. Ihe na-amasị ya bụ egwuregwu bọọlụ nkata, isi nri, iri nri, ide ihe, nakwa ịtụ okwe. Paul Ephraim Ihe e ji mara ya bụ JayPaul, ọ bụ onye oti egwu bi na Legọs. Ọ dị afọ iri abụọ na itoolu (29); ihe na-amasị ya bụ imepụta egwu, ime ejije, ịgba egwu na isi nri. JayPaul kwuru na nne ya na ụmụnne ya nwaanyị abụọ bụ ihe kacha enye ya obi ụtọ, n'ihi na nna ya alaala mmụọ. Ọ kọwara onwe ya dịka onye nwere obi sarị sarị nakwa onye na-enwe obi nchekwube oge niile. Samuel Jacob Alifa Sammie ka bụ nwa akwụkwọ na mahadum Ahmadu Bello University dị na Zaria, Kaduna steeti. Ọ bụ onye na-emepụta ihe ejije nke bekee kpọrọ 'filmmaker'. Ihe ọzọ na-amasịkwa nwa amadị a dị afọ iri abụọ na isii (26) bụ ịkọ akụkọ, ịkụ bọọlụ nkata, nakwa izute ndị mmadụ. N'afọ 2020, ka Sammie mepụtara ejije nke mbụ ya, mana ihe dị ya mkpa ugbua bụ iwulite akara 'Youtube' ya iji nyere ọrụ ya aka. Emmanuel Umoh Emmanuel bụ nwa afọ Akwa Ibom steeti ma bụrụkwa 'model'. Ọ bụ ya bụ onye Naịjirịa mbụ meriri asọmpi 'Mister Africa'. Ọ dị afọ iri abụọ na anọ; o nwekwara ụlọ mmegharị ahụ (fitness centre) na Port Harcourt ebe o bi. Yerimene Abraham Saibakumo Nwa amadia e ji Yerins mara bụ dọkịta nwetara ọzụzụ na mba Ukraine. Ọ dị afọ iri abụọ na asaa ugbua, ihe na-amasịkwa ya bụ ịtụ okwe 'chess', ige egwu, iti egwu, nakwa ise ihe. Ọ kọwara onwe ya dịka onye na-achọ ịmata ihe nakwa onye na-ekepụta ihe ọhụrụ. Adeoluwa Okusaga Saga bụ onye Legọs steeti, ọ dị afọ iri abụọ na asatọ. Ọ na-arụ n'ụlọọrụ mmepụta mmanụ agbịdị n'elu osimiri (offshore). Ịgba egwu, ịgụ egwu, ise ihe, nakwa ịmegharị ahụ bụ ụfọdụ ihe ka amasị ya. O kwuru na ihe karala wute ya na ndụ a bụ oge nne ya - onye ọ kọwara dịka ezigbo enyi ya - lara mmụọ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-57952310 +politics Northern Governors Forum meeting: Ihe atọ ndị gọvanọ ugwu sị mere ha ejighị nabata inyefe Ndịda Naịjirịa ọchịchị "Gọvanọ steeti 19 nke dị n'ugwu Naịjirịa ekwuola ebumnobi ha banyere atụmatụ inyefe ndị ndịda Naịjirịa ọchịchi n'afọ 2023. N'ọgbakọ ha mere n'obi gọọmentị Kaduna n'ụbọchị Mọnde bụ ụbọchị 27 nke ọnwa Septemba, ndị gọvanọ a sị na okwu ka e nyefee ọchịchị adịgh�� n'iwu Naịjirịa. Okwu ha wụrụ mmiri oyi n'ebumnuche ọtụtụ ndị ndịda Naịjirịa na ọchịchị kwesịrị irute ha dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ onye Ugwu ga-achị afọ asatọ ya ma ọ chịruo afọ 2023 mgbe ọchịchị ya kwesịrị ịgwụ. Ndị gọvanọ Ugwu Naịjirịa sị na iwu Naịjirịa nke 1999 anabataghị inyefe ọchịchị. Ha sị na n'agbanyeghi na ụfọdụ n'ime ha na-akwado ka e nyefee Ndịda Naịjirịa ọchịchị maka udo na ịdị n'otu nke Naịjirịa, ọgbakọ ha anabataghi atụmatụ ahụ dịka ọgbakọ ndị gọvanọ ndịda Naịjirịa siri kwuo ya ma ncha. Mmadụ dị ka Nasir El-Rufai bụ aka na-achị Kaduna Steeti na Abdullahi Umar Ganduje nke Kano Steeti, bụ ndị gọvanọ Ugwu kwuru na e kwesịrị inyefe ndị Ndịda Naịjirịa ọchịchị site n'atụmatụ Bekee kpọrọ zoning. Ụzọ atọ ndị gọvanọ Ugwu sị na onyeisiala ga-esi pụta: 1: Onye nwetere vootu karịa na ntuliaka 2: Onye ritere pasentị 25 na nkewa 2/3 steeti niile dị na Naịjirịa 3: Ya bụrụ na mmadu abụọ zọgharịrị, onye nwetere karịa Ihe a niile e kwuru bụ ihe dị n'iwu Naịjirịa nke 1999 ma bụrụkwa usoro Naịjirịa ji ahọpụta onyeisiala nakwa gọvanọ, mana nke ahụ egbochighị atụmatụ zoning na mba ahụ. Ọ bụ atụmatụ a mere mmadụ abụọ zọrọ ọkwa onyeisiala na pati abụọ kacha seputa isi n'afọ 1999 bụ Peoples Democratic Party (PDP) na Alliance for Democracy (AD) jiri bụrụ ndị Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa. Ọ bụ ebe a ka gọvanọ si steeti 17 nke Ndịda Naịjirịa gbadoro ụkwụ were sị ka e mee nwata ka e mere ibe ya ka obi wee dị ya mma. Otu ihe na-agbagwoju ndị mmadụ anya na ntụliaka Naịjirịa bụ ihe Bekee kpọrọ ""zoning"". Ọtụtụ mmadụ aghọtaghị etu okwu ""zoning"" a jiri malite na uru ọ na-aba. Na nke nke, zoning bụ atụmatụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị wepụtara, iji hụ na ohere ịwepụta onye ga-achị obodo, okpuruọchịchị maọbụ mba n'usoro onyekwuouche ya esighi sọsọ ofu mpaghara. A na-emebu zoning a na gboo, dịka isi ndị a rie, ndị ọzọ erie. Mana, ọ bụ na ntụliaka nke 1999 ka ọ pụtara ka ihe otu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naijiria ji mere iwu edeghi n'akwụkwọ. Na 1999 ahụ, pati meriri ntụliaka bụ People's Democratic Party (PDP), nke Olusegun Obasanjo bụ onye zọrọ oche dịka Onyeisiala n'okpuru ha. Nkwekọrịta ndị PDP nwere tupu e mee ntụliaka ahụ bụ na ịhụ na onye ọbụla nwere olileanya na Naịjirịa bụ nke ha, ka e nye ndị ndịda Naịjiria ohere ịwepụta onyeisiala. Cheta na mgbe ahụ, ọ bụ naanị Ernest Shonekan bụ onye abụghị onye ugwu chịrị Naịjiria. Shonekan na onwe ya enwetaghị oche ahụ na ntuliaka. Nke a mere n'ime Pati niile isi ha pụtara ọfụma, ọ bụ onye ndịda Naịjirịa zọrọ ọkwa onyeisiala. Nke pụtara na mmadụ abụọ ndị ọdịda anyanwụ nke ndịda Naịjiria bụ ndị ndị mmadụ nwere ohere ịtụnyere. Kemgbe ahụ, otu ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche na-esikari etu a ahọpụta ndị ga-azọ ọchịchị n'okpuru ha. Na ntụliaka 2019, pati abụọ aha ha na-ada ụda karịa bụ PDP na All Progressives Congress (APC) nyere ugwu Naijiria ohere ịwepụta mmadụ. Nke a mere e ji nwee Onyeisiala Muhammadu Buhari na Abubakar Atiku dịka ndị na-azọ ọchịchị n'okpuru ha. N'Ala Igbo, a na-emekwa zoning a. Dịka n'Enugwu, onye na-achị ugbua bụ onye mpaghara Nsukka, onye chịburu bụ onye mpaghara Udi. Gọvanọ Steeti ndị Ugwu Naịjirịa ekweghi etinye ọnụ n'okwu ụtụisi ""Value Added TAX"" (VAT) makana ha sị na ọ nọ n'ụlọikpe. Mana ha kwukwara na ọ bụrụ na steeti niile mere iwu ụtụisi nke ha na ọ ga-eme ka ndị mmadụ na-akwụfe ego ụtụisi." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58711903 +entertainment Happy New Year 2022: Etu ndị Igbo si achụ afọ ochie ma nabata afọ ọhụrụ Ụbọchị mbụ nke afọ ọhụrụ bụ ụbọchị ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya ya nke ukwu n'ụwa gbaa gburugburu. Ọtụtụ mba, na-agbanyeghi okpukperechi ha, nwere emume ha na-eme n'abalị ga-abọta ụbọchị ahụ (new year eve) iji nabata afọ ọhụrụ. Ndị Igbo n'aka nke ha anaghị ekpete azụ n'emume na-eso nnabata afọ ọhụrụ. Ha na-ahụta ụbọchị mbụ nke afọ ọhụrụ dịka ụbọchị kachasị oke mkpa n'ime afọ n'ihi olileanya ha nwere na ọ ga-aka mma karịa afọ gara aga. Ọ na-amasị ndị Igbo nke ukwuu ịnọ n'obodo ha achụ afọ ochie ma nabata nke ọhụrụ. Nke mere ọtụtụ ndị Igbo ji emechi ọrụ ha, azụmaahịa na ọdọahịa ha niile ma lawa obodo ha iji gbaa afọ ọhụrụ. Onye ọkammụta n'asụsụ nakwa omenala Igbo bụ Maazị Chigozie Nnabuihe sị na ịchụ afọ bụ ihe dịrị onye ọbụla n'obodo. Na ọ bụ ihe ndị Igbo ji ekele Chineke maka afọ nke gara aga nakwa ị rịọ ya ọ dị mma nke afọ na-abịa abịa. Maazị Nnabuihe sị na mgbe gboo na a na-emere ya omenala pụrụiche mana dịka ọ dị ugbua na ọ bụzi onye ọbụla maọbụ ezinaụlọ ọbụla na-agọ ọfọ ọma n'isi onwe ha. Ndị dịka dibia ụlọ, ndị okenye ọha obodo maọbụ ezemmụọ na-atụpụ mmanya ma gọọ ọfọ n'isi ezinaụlọ, ọha obodo nakwa ndị na-efe chi ha. Maazị Nnabuihe sị na ụfọdụ ekpere na ọfọ a na-agọ n'elu afọ ọhụrụ gụnyere; O nweghi kpọmkwem oge a ga-asị kachasị mma ịgọ ọfọ maọbụ ikpe ekpere kama ọ na-abụkaarị awa ole na ole ka abanye afọ ọhụrụ. Dịka ọ dị ugbua, ndị okpukperechi Kraịst na-agazi n'ụlọụka ha dị iche iche iji kpee ekpere ịnabata afọ ọhụrụ. Ekpere ha na-ekpe n'ụlọụka adịchaghị iche na nke dibia ụlọ, ndị okenya ọha obodo maọbụ nke Ezemmụọ n'ekpe. Ekpere na ọfọ niile a na-ekpe maọbụ na-agọ bụ ikele Chineke maka afọ gara aga ma rịọ maka ọ dị mma afọ ọhụrụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-55482986 +sports Israel Adesanya emeriela Robert Whittaker n'asọmpị UFC 271 "Israel Adesanya emeriela Robert Whittaker ma jidesie ike ọkwa ya dịka ọkaibe Ultimate Fighting Championship(UFC) middleweight. Ha abụọ sọkọtara mpi n'ogụ UFC 271 taa bụ Sọnde n'elekere nke West Africa. Asọmpị ha abụọ bụ nke ọtụtụ mmadụ na-eche tụmadị n'ogo UFC middleweight. Ọgụ UFC 271 a bụ nke ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ mere na Toyota Center dị na Houston, Texas, dị na Amerịka. Mgbe ha abụọ sọkọtara mpi afọ atọ gara aga n'ogo middleweight , Adesanya kụpụrụ Whittaker ihe tinka kụrụ pan. Ha abụọ zụkọtara mbụ n'ogo UFC 243 n'ọnwa Oktoba 2019, mgbe Adesanya meriri Whittaker n'agba nke abụọ. Adesanya bụ ọkaibe na middleweight ma nọsie ike n'ogo ahụ kamgbe o meriri ọgọdọ ukwu. Tupu ugbua, Adesanya emeriela ọgụ ruru 21 ebe Whittaker emeriela ọgụ ruru iri abụọ na anọ. Mana mmeri a Adesanya meriri ugbua, emeela ya nke iri abụọ na abụọ. Adesanya akpụọla afọ n'ala otu ugboro mana Whittaker akpụọla afọ ugboro ise. Ha abụọ ababeghị ogo nhatanha. Adesanya dị afọ iri atọ na abụọ (32) bụ onye Naịjirịa na-emere mba New Zealand egwuregwu mixed martial mabụrụkwa onye na-akụbụ ọkpọ. O ritela ọtụtụ nturugo n'egwuregwu ""mixed martial"", ""kickboxer"" nakwa ọkpọ kamgbe ọ malitechara njem egwuregwu ndị a n'afọ 2012. Dịka onye na-eme egwuregwu mixed martial, Adesanya debanyere aha na Ultimate Fighting Championship (UFC) ebe ọ bụ ọkaibe. Nne na nna ya bụ ndị Yoruba bụ otu agburu nọ na Naịjirịa. Aha otutu ya bụ ""Style bender"". Ka o merichara Whittaker ugbua, Adesanya kwuru na ọ ga-alọghachite n'ọnwa June ebe ya na Jared Cannonier bụkwa ọkaibe n'asọmpị middleweight ga-asọkọta mpị. Lee mba ndị sị ndị bee ha kwara pụọ na Ukraine Odeakwukwọ mba Amerịka bụ Anthony Blinken ekwuola na etu e si eche na mba Russia ga-akpa akpa na Ukraine bụ ihe kpatara ha ji asị ka akpọpụ ndị mba US nọ n'ụlọọrụ ha dị na Kyiv. Nke a na-abịa dịka onyeisiala Ukraine na-arịọ ka e jiri nwayọ ma na-ekwu na ihe na-enye nsogbu ugbua bụ ụjọ. Ihe karịrị mba iri na abụọ asịla ndị bee ha kwara pụwa na Ukraine. Agbanyeghị na Moscow nwere ihe ruru ndị agha otu narị puku n'oke ala ha na Ukraine, Russia na-ekwusi ike na ha achọghị ịwakpo Russia. Yuri Ushakov bụ onye ndụmọdụ ụlọọrụ(Kremlin) onyeisiala mba Russia kwuru ka ndị mmadụ gbachị mba US nkiti n'ịdọ aka na ntị ha na-eme ma na-ekwu ha na-etinye ụjọ n'ahụ ụmụ ụwa. Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden dọrọ onyeisiala mba Russia bụ Vladmir Putin aka na ntị n'ekwenti maka nsogbu mwakpo ọbụla ga-esi n'aka Russia ha ga-ebute. Odeakwụkwọ ndị ọrụ nchekwa nọ na UK bụ Ben Wallace kwuru na mwakpo ga-esi n'aka mba Russia bia nwerike ịbia ""mgbe ọbụla."" Wallace ji ihe mere n'oge Nazi Germany were tunyere ihe na-eme ugbua n'etiti ndị ofesi na Russia ugbua. Kedụ ihe mere Russia ji eyi Ukraine egwu? Russia agbaala mbọ igbochi mba Ukraine isonye n'otu NATO na otu ndị ọzọ jikọrọ mba ndị nọ n'Europe. Oke ala Ukraine metụtara mba Russia n'otu European Union (EU). Ukraine bụbu otu n'ime mba ndị si na Union of Soviet Socialist Republics (USSR) pụta. A na-asụ Russia na mba Ukraine ebe e nwere ụfọdụ omenala a na-eme na Russia ma na-eme na mba Ukraine. Gịnị bụ NATO? NATO nke pụtara North Atlantic Treaty Organisation, bụ nzụkọ ndị agha e hiwere n'afọ 1949. Ọ bụ mba iri na abụọ bidoro ya nke gụnyere Amerịka, Canada na France. Ndị mba nọ na nzukọ a kwere onwe ha nkwa na ha ga-agbatara ibe ha ọsọ enyemaka ma ọgụ daa. E hiwere ya iji gbochie mba Russia ịgbasa na mba ndị ọzọ. Mgbe ngalaba Soviet Union dara n'afọ 1991, ụfọdụ ndị mba nọbu na ya banyere otu NATO." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60278855 +entertainment Etu e si eme emume iri ji ọhụrụ n'Enugwu-Ukwu "Ji bụ nri a kacha akwanyere ugwu n'ala Igbo. Kwa afọ, obodo ọbụla n'ala Igbo na-ewepụta otu ụbọchị iji mee emume pụrụ iche tupu ha amalite iri ji ọhụrụ nke afọ ahụ. Emume a na-adabakarị n'ime ọnwa nke asatọ maọbụ ọnwa nke itoolu, ya bụ Ọgọst maọbụ Sepụtemba. BBC Igbo gara obodo Enugwu-ukwu dị n'Anambra steeti iji sonyere ha n'emume iri ji ọhụrụ nke afọ 2022, ka ha kọwaarọ anyị mpụtara omenala dị icheiche ha na-eme n'oge iri ji ọhụrụ. Igwe Ralph Ekpe bụ eze ọdịnala nke obodo Enugwu-Ugwu ma bụrụkwa Igwe Umu Nri, kọwara na emume iri ji ọhụrụ bụ emume e ji ekele Chukwu. Ọ kọwara na ọtụtụ mmadụ, ọ kachasị ndị na-ekpe okpukperechi Kraịst, na-ahụta ya dịka ịgọ arụsị, mana ọ bụghị ya. ""Ọ bụ emume anyị ji ekele Chukwu onye nyere anyị ji ka agụụ hapụ igbu anyị, ka anyị rekwaa ya n'ahịa wee hụ ego anyị ji egbo mkpa,"" Igwe Ekpe kwuru. ""Obodo dị icheiche nwere ihe ha na-akpọ ya, ụfọdụ na-akpọ ya emume ịwa ji, mana anyị bụ Enugwu-Ukwu na-akpọ ya iri ji."" Igwe Ralph Ekpe kọwara na ji nwere nkwanye ugwu pụrụ iche ndị Igbo na-akwanyere ya. Ha gụnyere ndị a: Gerezie etu Igwe Ralph Ekpe si kọwaa ya n'ihe onyonyoo dị n'elu." https://www.bbc.com/igbo/articles/c1v4zdklz71o +business Enugu Airport Closure: Amapụtala m ijeri naịra 10 maka ịrụzi ọdọụgbọelu Enugwu - Buhari "Akụkọ dị mkpa Amapụtala ijeri naịra 10 maka ịrụzi ọdọụgbọelu Enugwu - Buhari Onyeisiala Muhammadu ekwuola na ọmapụtala ego dị ijeri naịra iri maka ịrụzi ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu. O kwuru na o mere nke na-agbanyeghi ụkọ ego dị n'iji arụpụtala ihe dị iche iche chere gọọmentị n'ihu. Onyeisiala Buhari sị na dịka ọ bụ ọrụ dịrị gọọmentị ya ịrụ akụrụngwa dị n'obodo na ọ bụ nke a. O kwuru na minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekweela ya ngwa na a ga-arụcha ọdọụgbọelua n'oge na-adịghị anya. Cheta na o ruola ihe dịka izuụka itoolu gọọmentị mechiri ọdọụgbọelu ma kwuo na a chọrọ ịrụzi ya. Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ka ebelata ego ndị ọrụ gọomentị gbalitere n'ọkwa. Site ụgbụa gawa n'ihu, 1) Nanị ụbọchị onye ọrụ a kwesịri i nọ maka nzụklo ọbụla ka gọọmenti ga akwụ ụgwọ ya. 2) Onye ọbụla na-aga nkem ga egosi akwụkwo na-egosi ihe kpatara o ji eme njem. 3) Ọ bụ nanị njem gbasara gọomenti ka a ga agwụ ụgwọ ya. 4) Mmadụ anọ nani ga eso ndị minista eme njem nke ga agunye 'Director', 'Schedule Officer' na onye enyemaka Minista. Ndị minista ka n'ọkwa bụ mmadu atọ. 5) Onyeisiala kwuru na ọ bụ nani ụgboro asatọ ka gọomentị ga-akwụ ụgwọ njem n'afo. kama,ndị minista, 'Permanent Secretary', onyeisioche ndị 'Extra-Minsterial Departments', 'Chief executive officers' na ndị 'Director'. Ndịagha Naịjirịa esila n'ịgba Egwueke banye Atilogwọ Udo Ndịagha Naịjirịa sị na emume 'EGWUEKE' ha na-eme n'ọwụwanywnụ Naịjirịa ga na-aza zi 'ATỊLỌGWEỤ UDO'. Ozi a dị n'akwụkwọ ozi si n'akara Twitter ha bụ nke onye nghazi mgbasaozi ha bụ Aminu Iliyasu tinyere aka na ya. Emume a dịka ha si kwuo bụ nke ha na-eji azụ ndịagha n'ụzọ dị iche iche malitere n'afọ 2016. Ndịagha sị ha na-ejikwa emume a ememina mpụ ndị dịka ohi, ntọrị mmadụ, agha ndị otu nzuzo, esemokwu dị n'etiti obodo nakwa ndị ọzọ. Ha kwukwara na mgbanwe aha emume apụtaghị na usoro e ji eme ya agbanwela, na usoro niile ha ji eme ya ka kwụ etu ọ dị na mmalite. Cheta na ọ bụ n'oge emume 'EGWUEKE' nke afọ 2017 ka ndịagha wakporo ụlọ onyendu Ipob bụ Nnamdị Kanu dị n'Afara Ukwu Ibeku Umuahia nke Abia Steeti. Boris Johnson sị na Briten na UK enweela nkwekọrịta Otu 'European Union' na mba Briten enweela nkwekọrịta maka etu Briten ga-esi hapu EU dịka Praịm Mịnịsta Briten bụ Boris Johnson sị kwuo. Ha nwere mkparịtaụka a n'Obodo Brussels nke dị na mba Belgium. Johnson kwuru na ""anyị enwetela ezigbo nkwekọrịta ga-enye anyị nnwereonwe"". Ọ teela ndị isi mba abụọ a ji enwe mkparịtaụka maka ọdịmma onwe ha ma ọ bụru na Briten hapụ EU, mana nkwekọrịta a ha nwere ka ga-aga n'ihu ndị omeiwu mba Briten nakwa nke ndị EU iji binye ya aka. Mana ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị a kpọrọ 'Democratic Unionist Party' (DUP) ka na-ekwusi ike na ha akwadoghi nkwekọrịta a. Ndị pati a bụ nke ndị Northern Irish ekwubụọla na ha agaghị atụkwasi obi n'okwu Johnson. Onyeisi ndị anọghị n'ọchịchị bụ Jeremy Corbyn boro aka n'isi tie mkpu sị na mkpebi a Johnson na aṅụrịrị kakwa njọ karịa nke Theresa May nwetere. Corbyn kpọkuru ndị otu ya ka ha ghara ịge Johnson nti n'ihi na okwu ya bụ okwu onye awụrụaka. N'aka ọzọ onyeisi European Commission bụ Jean-Claude Juncker sị na ya bụ mkpebi dị mma n'ụzọ ga-abara mba abụọ ahụ uru. Ị nụrụ na nwunye onyeisiala bụ Aisha Buharị enweela ndị enyemaka mmadụ isii ọhụrụ. A nụrụ na ndị a gụnyere Mairo Almakura, Muhammed Albishir na Wole Aboderin. Ndị ọzọ bụ Aiyu Abdullahi, Zainab Kazeem na Funke Adesiyan. Aisha ji ohere a arịọ mgbaghara maka ya bụ ihe onyonyo pụtara na sochịal midia ebe ọ na-abamba. Akọgbuola onyeisiala Trump n'ọnụ maka mkpọpụ ọ kpọpụrụ ndịagha Amerịka na Syria. Trump n'onwe ya achọkwaranụ ịma, ebe ọ na-ekwu na Amerịka abụghị ndị uweojii mbaụwa. A na-eche na ọ bụ maka ọpụpụ a Amerika pụrụ mere ndị Turkey ji malite ibuso ndị Kurd agha ọzọ. Kedu ka ị sị hụ ọnọdọ Manchester United n'Asọmpi ha na Liverpool na-aga ịgba? Onwebeghi onye ma ebe ha bụ asụrụ asụ dewere ọdụ ebe a sị na Paul Pogba agaghị esokwa gba ya bụ bọọlụ. Anyị nụrụ na Pogba merụrụ ahụ dịka ojisiaghọ mgbo ha bụ de Gea." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50078876 +business Canada Immigration: Ị chọrọ 'ịgbaga' mba a? Mba Kanada ekwuola na ha na-atụ anya ịnabata ihe ruru mmadụ otu nde na puku narị abụọ n'ime afọ atọ na-abịa. Nke a emeela ka ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị Naịjiria na-achọ ma ohere ọ ga-adịrị ha. Nke a abụghị mbụ ndị Naịjiria na-achọkwa etu ha si agafe mba Kanada. Mgbe e yigharịrị ntuliaka e kwesịrị ime n'ụbọchị 16 nke Febrụwarị 2019, ụfọdụ ndị mmadụ malitekwara ịchọ ụzọ ha si agbaga Kanada. O wuru ewu na soshal midia nke ọma, mere ka BBC wepụta ihe na-egosi etu ị ga-esinwu gaa (ma ike dịkwa gị o). https://www.bbc.com/igbo/afirika-47267889 +politics Ihe mere n'oge nke Abiola na 1993 ga-emekwa ọzọ na 2023 - Tinubu "Aka chịburu Lagos Steeti ma bụrụkwa onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na pati 'All Progressives Congress' bụ Bola Tinubu, ekwuola na ihe mere na ntuliaka Naịjirịa n'afọ 1993 ga-emekwa ọzọ n'afọ 2023. Tinubu kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara iji kọwaa ihe mere o ji họrọ aka chịburu Borno Steeti bụ Kashim Shettima dịka osote ya. Shettima na Tinubu bụcha ndị okpukperechi Islam, nke mere ọtụtụ ji akatọ pati APC maka ịgbakụta ndị okpukperechi Kraịst azụ. N'akwụkwọ ozi ya, Tinubu kwuru na ya ghọtara nke ọma na okpukperechi dị nnukwu mkpa na Naịjirịa, ""mana ọrụ chere anyị n'ihu ugbua abụghị okwu okpukperechi, kama ọ bụ maka onye bụ ọkaibe n'ịrụ ya bụ ọrụ."" ""Ekwenyere m na onye a m họpụtara bụ onye ga-enyere m aka ịchị Naịjirịa nke ọma, n'agbanyeghị agbụrụ maọbụ okpukperechi o si na ya,"" Tinubu kwuru. ""Iji weta ọganihu n'obodo anyị bụ Naịjirịa, oge eruola mgbe anyị ga-esi n'ụzọ ochie anyị pụta."" ""Na 1993, ụmụ Naịjirịa niile kwadoro MKO Abiola na Baba Gana Kingibe, ha abụọ bụcha ndị Islam, mana ntuliaka ahụ bụ nke kacha gaa nke ọma na Naịjirịa."" ""Mmụọ nke 1993 abịakwasala anyị ọzọ na 2023."" N'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa June afọ 1993, Naịjirịa mere ntuliaka iji họpụta onyeisiala ga-ewere ọchịchị n'aka ndị agha bụ ndị weghaara ochịchị n'afọ 1983. Na ntuliaka ahụ, Moshood Kashimawo Abiola onye zọrọ ọkwa onyeisiala na pati 'Social Democratic Party', ebe Baba Gana Kingigbe bụ osote ya. Ha abụọ bụcha ndị okpukperechi Islam. Ọ bụ eziokwu na onye agha Ibrahim Babangida, onyeisiala nọ n'ọchịchị n'oge ahụ, kagburu ya bụ ntuliaka, ọtụtụ kwuru na ọ bụ Abiola na Kingigbe meriri. Dịka Babangida kagburu ntuliaka ahụ, Abiola jiri aka ya kpọpụta onwe ya dịka onyeisiala Naịjirịa n'ọnwa June afọ 1994. Mana Sani Abacha, onye agha weghaara ọchịchị n'aka Babangida, nwụchiri Abiola, tụkpuo ya na mkpọrọ ebe ọ nọrọ nwụọ n'abalị asaa nke ọnwa Julaị afọ 1998. Bola Ahmed Tinubu nke ji pati All Progressives Congress (APC) azọ ọkwa onyeisiala Naịjiria n’afọ 2023, ahọpụtala Sinetọ Kashim Shettima dịka osote ya. Tinubu kwuputere nke a dịka ya na Onyeisiala Muhammadu Buhari nwechara nzukọ n'obodo ya na Daura, Katsina steeti, n'ụbọchị ụka. Ọ sị na ọ họpụtara Shettima bụbu gọvanọ Borno steeti, n'ihi na ọ ""ma ihe ọrụ nyịrị, ọ ga-emeli ihe dị na ya, o ruru iji mee osote onyeisiala."" Cheta na Tinubu họpụtaburu Ibrahim Masari dịka onye ga-anọ dịka osote onyeisiala ruo mgbe ọ họpụtara onye ọzọ." https://www.bbc.com/igbo/articles/c1e91lg840no +health Coronavirus: Ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị na-achọ igbochi ịtụrụ ime na 'lockdown' a ọ na-arị elu? "Ọ bụ ihe aṅụrị ma nwaanyị lụrụ di tụrụ ime maka na nwa so n'isi sekpuntị na alụmdi na nwunye. Mana ụfọdụ ụmụnwaayị lụrụ di na-aṅụzị ọgwụ ga-egbochi ha ịtụrụ ime ọkachasị n'oge mmachi ngagharị a n'ihi coronavirus. N'oge a, ha na di ha na-anọkarị n'ụlọ nakwa enwe mmerịkọta kwa mgbe kwa mgbe, mana ha achọghị ka ""aka enwe ghọọ aka mmadụ."" BBC Igbo kpọtụrụ Nọọsụ Comfort Ogu bụ onyeisi nhazi n'ụlọọrụ 'Planned Parenthood Federation of Nigeria' ngalaba Abia Steeti. Ọ sị na ụmụnwaanyị na-abịa n'ụlọọrụ ha bụ ebe ha na-anara ọgwụ maka nhazi ezinaụlọ bụ 'Family Planning' kamgbe 'lockdown akarịala ndị na-abịa n'oge mbụ. Ogu kwuru sị: ""Na-agbanyeghi na anyị anaghị emepe ụbọchị niile maka mmachi ngagharị, ọtụtụ ụmụnwaanyị na-akpọ anyị n'ekwentị maka ị nara ọgwụ mgbochi ime."" ""Ndị na-abịa a nara ọgwụ mgbochi ime ugbua ga-eji ihe ruru pasentị iri isii karịa ndị na-abịa n'oge nkịtị."" Ogu sị na ọgwụ ụmụnwaanyị ndị a na-anara gụnyere ọgwụ ọṅụṅụ, nke ọgbụgba nakwa nke a na-etinye etinye. BBC Igbo jụrụ otu dọkịta ahụike ụmụnwaanyị bụ Joseph Akinde etu o sị hụta atụmatụ a ụfọdụ ụmụnwaanyị na-agbaso. Ọ sị na atụmatụ ha a dị mma. ""Kama ha ga-atụrụ ime ha achọghị, ọ ka mma ka ha gbochie ya."" ""Makana ọ bụ ihe megidere iwu Naịjirịa nakwa ihe ọghọm ite ime ma ọ bụrụ na ha e gbochighi ya."" Dọkịta Akinde gara n'ihu kwuo na ọnọdụ akụnaụba ugbua dị ezigbo ọjọọ na onye ọbụla mụrụ nwa ọ na-achọghị na-etinyekwuru n'ezinaụlọ ya nsogbu. O ruola izuụka atọ gọọmentị etiti nakwa nke steetị dị icheiche machiri ngagharị ndị mmadụ maka ọrịa coronavirus." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52375566 +politics Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ngige na Oshiomhole ka na-ama aka ọgụ Ngige na Oshiomhole ka na-ama aka ọgụ Chris Ngige bụ mịnịsta na-ahụ maka ọrụ aka na Naịjirịa agwala onyeisi otu paati APC bụ Adams Oshiomhole na ọ gaghị ewute ya chaachaa ma ọ bụrụ na ha kwụsị ya ọrụ ọ na-arụ n'APC n'ike. Buhari na ndị omeiwu ukwu emeela ọgbakọ Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari na ndị omeiwu ukwu ndị ka nọ n'APC nwere ọgbakọ maka inyocha usoro ha ga-eji kwụsị ndị otu ha ịhapụ pati ha gawa ebe ọzọ. Mgbe ha mechiri ọgbakọ a, ha gwara ndị ntaakụkọ na otu ha ka nwere ndị omeiwu kachasị n'ọnụọgụgụ n'ime ụlọomeiwu ukwu. India na-akwadebe imepe ụlọọrụ 'Embaassy' 18 na Afirika Na mba ofesi, ala India ekwuola na ha ga-emepe ụlọọrụ nnọchịteanya nke bekee kpọrọ Embassy ruru iri na asatọ na mpaghara Afrịka. N'aka ọzọ, a ka na-agụ akwụkwọ mbinyeaka nke ntụliaka mere n'ala Pakistan. Ugbua ọ dị ka Imran Khan bụbụ onye omee egwuregwu Kricket na-enwe mmeri. Manchester United emiela AC Milan N'egwuregwu, otu Manchester United ejila penariti merie AC Milan n'asọmpi International Champions Cup n'ụtụtụ a. Ha gbaburu otu ọkpụ otu ọkpụ tupu ha a banye penariti, ebe Man U ji ọkpụ itoolu asatara asatọ wee merie ha. Gee nkeji anyị Lee ihe nkiri anyị https://www.bbc.com/igbo/afirika-44964411 +politics Babagana Umara Zulum: Amaghị achị butere ọgbaghara a niile na-eme na Naịjirịa Ka ndị omekome wakpochara gọvanọ Borno bụ Zulum Umara Babagana mgbe ya na ndị nchekwa ya na-aga n'ụzọ, ọ gwala BBC ihe kpatara nsogbu a. O kwuru na ọ ga-adị mma ka e were ngwa ngwa gboo nsogbu enweghị ọrụ na ụbịam n'etiti ndị ntoroọbịa Naịjirịa ka o belata ọnọdụ tigbuo zọgbuo na-eme ugbua. Gere ya n'uju ebe a: Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-53880818 +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Okocha ekwuola echiche ya gbasara mmeri Super Eagles Okocha ekwuputego obi ya maka mmeri Super Eagles Dịka ka Krueshịa siri pịa Super Eagles ọkpụ abụọ na asataghị ihe, Austin Okocha bubu onye otu Super Eagles ekwuola na mmeri a bụ maka ọtụtụ ndị egwurewgu Super Eagles anaghị agba n'ebe ha kwesiri igba n'ọgbọ egwuregwu. Mgbọ ogbunigwe dara n'obodo atọ n'ime Benue steeti ụnyahụ. Mana ọ bụ ndị aghaelu Naịjirịa tụrụ ya. Ọnụ na-agbasa ozi a bụ Olatokunbo Adesanya gwara ndị ntaakụkọ owku a mana o kwubeghị ihe buture yabụ omume. Nysom Wike esoghị na ntụlịaka okpuru ọchịchị Rivers Akụkọ na-apụta na Rivers steeti kwuru na gọvanọ ha bụ Nyesom Wike ekweghi i binye aka na ntụlịaka ịhọpụta ndị ga-achị n'okpuru ọchịchị nke steeti ahụ. Akụkọ a kwukwara na otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC jiri iwe kwuo na ha agaghị eso na ntụlịaka a makana akwụkwọ mbinye aka na ndị ọrụ ntụlịaka abịaghị n'oge n'ọtụtụ ebe na PortHarcourt. Spain anabatala ndị mbịambịa Mba Spain anabatala ụgbọ nke mbụ bụ ndị mbịambịa azọpụtara na mmiri Mediterranean ma bụrụkwa ndị Malta na Italy jụrụ inabata n'izu ụka garaga. Gee akụkọ anyị n'ụtụtụ a https://www.bbc.com/igbo/media-44511089 +business Salle: Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka nwada a Salle si n'ibugharịa ahịa bụrụ otiegwu na-ewu ewu Izu ole na ole gara aga, o nweghị onye ma ya mabụ onye nụtụrala aha ya karịa ndị ezinaụlọ ya na ndị agbata obi ha. Mana n'otu ntabịanya, nwada Salle akụkọ kwuru na ọ bụ ebe ọ na-ebugharị ahịa n'Owere, Imo steeti ka a nụrụ olu egwu ya, ya aghọọla akara ọkụ. Ndị obiọma mịtara egwu ya ma tinye ya na ịntanet dịka ha zigara ya ndị na-emepụta egwu a na-ahụ aha ha na Naijiria. Ugbua, naanị otu ịzụ ụka akụkọ ya jiri gbaa, o nwetala ihe karịrị ndị nsonso karịrị narị puku abụọ. Mana ụfọdụ na-eche na akụkọ ya bụ akụkọ Mama Ngozi na ndị yard ya nke e ji chọọ ime ka ụwa mata maka nwada ahụ olu ya na-ada ka ogene. Akụkọ ka na-abịa https://www.bbc.com/igbo/58682653 +politics Jihadists in Mali: Etu nrụrụaka dị n'etiti ndịagha mba Mali si ebute ọnwụ ha BBC Africa Eye nyopụtara etu nrụrụaka dị n'etiti ndịagha Mali si ebute ọnwụ ha n'aka ndị na-eyi ndụ egwu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-57992737 +entertainment Nollywood Movies: Ka e si emepụta ejije Igbo "Ị ma etu e si emepụta ejije ndị ị na-ele n'onyonyo gị? BBC Igbo gara soro ndị na-eme ejije Igbo hụ etu ha si emepụta ndị na-amasị gị. ""Director"" na-ahụ maka nhazi usoro e si eme ejije, kọwara ihe ha na-agabiga ịchịkwa ndị na-eme ejije. Onye ""producer"" bụ onye nwe mmepụta ejije, kwukwara etu ego e si emepụta ejije na-esi abanye ha n'aka. Lee ihe nkiri a ka ị jiri anya gị hụrụ. Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho, Nnamdi Kelechi Agbanelo" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48735839 +politics Roe v Wade: Etu mmachi Amerika machiri ite ime ga-esi metụta ụmụnwaanyị Naijiria "Otu ndị na abụghị nke gọọmentị na-agba mbọ maka ikike dịị ụmụnwaanyị na Naijria ekwuola na mkpebi ahụ nke Ụlọikpe Kachasị na mba Amerika nyere ụbọchị Fraide nke machiri ikike nwaanyị ite ime ga-ebutere ụmụnwaanyị nsogbu ahụike. Ụlọikpe Kachasị nke Amerịka nọrọ n'ụbọchị Fraide(24/6/2022) kagbuo ikike ụmụnwaanyị nọ na mba ahụ nwere ite ime . Onye nchịkọta ngalaba ikike dịrị ụmụnwaanyị (Manager, Women's Right Program)nke ụlọọrụ Actionaid Nigeria bụ Nkechi-Ilochi-Omekedo kwuru na "" iwepụ ohere ụmụnwaanyị ite ime mgbe ọ dị na mkpa ga-eme ka ọtụtụ ndị chọrọ ya malite ite ime azụ ụlọ nke nwere ike iti ha na nnukwu nsogbu ahụike dị iche iche maọbụ ọnwụ"". ""Ọ ga-eme ka ọtụtụ mụọ nwa ha ga-akpọ asị ọkachasị ma ọ bụụ na-awakporo ha n'ike ha were dị ime."" ""Nke a ga-emekwa ka uru nile na mbbọ nile a gbarala n'okwu inye ụmụnwaanyị ikike dịị ha ga-ala n'iyi."" Ite ime megidere iwu na Naijiria mana ọtụtụ ndị na-agba mbọ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị etinyela ọtụtụ afọ n'ịgba mbọ ka e tinye ya n'iwu ụmụnwaanyị inwe ikike ite ime ma ha chọọ. Mana dịka ndị na-agba mbọ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị na-atụ arịri maka mkpebui ahụ, Ụka Katọlik na ndị akwadoghị ite ime kwuru na ọ bụ nnukwu ihe ọma mere ụwa. Ọnụ na-ekwuru ụka Katolik na Dayọsis Enugwu bụ Fada Benjamin Achị gwara BBC Igbo sị, "" Mkpebi ahụ bụ otu n'ihe kachasị mma mere Amerịka na ụwa gba gburugburu."" O kwuru na ikpe Woe na Wade ahụ e biri n'afọ 1973, bụ mpụ ka ọchịchị mba Amerịka mere megide ezinaụla nakwa mmadụ. "" Mmkebi ahụ s gosiri na a ka nwere nkwanyere ugwu nye ndụ mmadụ nke bụ ihe ọma kacha ibe ya."" Ụlọikpe Kachasị na Amerịka anapụla ụmụnwaanyị nọ na mba ahụ ikike ite ime dịka ụlọikpe ahụ kụpụrụ mkpebi e tinyere afọ 50 gara aga. Mkpebi ahụ (nke ọkaikpe asaa kwenyere na ya, ebe abụọ jụrụ ajụ) nke e kwubiri n'afọ 1973 n'ikpe dị n'etiti Roe na Wade nyere nwaanyị ikike iwepụ afọime nke iwu mba Amerịka kwadoro. Mkpebi nke taa ga-agbanwe ikike nwaanyị nwere ite ime dịka steeti ọbụla dị n'Amerịka ga-enwezi ike ịmachi iwepụ afọ ime. A na-ele anya na ọkara steeti dị na mba Amerịka ga-amalite ịmachi ite ime. Ka ọ dị ụgbụa, steeti 13 etinyela iwu ga-akpalite mmachi ahụ. N'afọ 1969, otu nwaanyị alụbeghị di gbara afọ 25 bụ Norma McCorvey mana e nyere ya aha otutu ""Jane Roe"", gbara akwụkwọ iji gbaghaa iwu machiri ite ime dị na Texas. Steeti ahụ machiri ite ime dịka ihe megidere iwu belụsọ ma ndụ nwaaanyị bu afọ ime ọ‘ nọ na nsogbu. Mana n'ikwado iwu machiri ite ime, Ọkaukwu ukwu(district attorney) nke Dallas County bụ Henry Wade nke mere ka a kpọwa ikpe ahụ ikpe dị n'etiti Roe na Wade. Roe onye dị ime nke atọ kwuru na ọ bụ mwakpo ka a wakporo ya mana a jụụ ike ya nke mere ka ọ mụọ nwa ahụ. N'afọ 1973, ọ gbagharịrị akwụkwọ nke mechara ruo Ụlọikpe Kachasị ebe e kpere ike ya nakwa nke nwaanyị onye Georgia aha ya bụ Sarah Bensing. Ha abụọ kwuru na iwu megidere nwaanyị ite ime megidere ikike nwaanyị ịnọrọ onwe ya. Ikpe Roe na Wade gbanwere ọtụtụ ihe banyere ikike ụmụnwaanyị. Nke a gụnyere:" https://www.bbc.com/igbo/articles/c2jvpkrg7ljo +health Dementia: Kedụ ihe mere ọrịa a ji akawanye njọ ugbua? "Dementia bụ otu n'ime ọrịa na-emetụta ụbụrụ ndị mmadụ nke na-eme ka ha chezọọ ihe mere nsoso a. Dịka ngalaba WHO si kwuo, ihe karịrị mmadụ nde ise na ụma ise bụ ndị bu ọrịa ahụ ma kwuo na ọnụọgụgụ a nwereike iji ugboro atọ rịa elu n'afọ ole na ole na-abịa. Mgbe achọpụtara ọrịa a n'afọ 1908, ọbụghị ọrịa na-emetụta mmadụ niile mana ugbua otu onye na-ebute ya kwa ntabi anya atọ Mana n'agbanyeghị nke a, naanị otu mba n'ime mba anọ nwere iwu na-enyere ndị na-agabiga ọrịa a aka. Ọrịa Dementia bụ ọrịa na-emetụta akụkụ ụbụrụ akpọrọ 'Hippocampus' nke bụ ụzọ e si abanye ihe jikọrọ echiche. Seheli Jahan bụ onyeisi ọgwụ ụbụrụ n'ụlọọgwụ Bangladesh kwuru na ọ bụ 'ọrịa nchefu ihe' na nkenke. Ọ kọwara na ọ na-ara ahụ ka onye bu ọrịa dementia cheta ihe mere nsonso a mana ha na-enwe ike ịcheta ihe mere n'oge gara aga. ""Ọ na-aka mma na ndị bụ ntorobịa n'ihi na hippocampus' ka nwere ahụike, ọ na-akpọ nkụ ka mmadụ na-aka nka"" E nwere udiri ọrịa anọ bụ vascular dementia, Alzheimers dementia, live body dementia, frontal temporal dementia nakwa Parkinson's dementia. Ọ bụ ọrịa Alzheimers dementia bụ nke kachasị emetụta ndị mmadụ. Mgbanwe omume bụ ihe mbụ e ji achọpụta ndị nwere Dementia. Ihe ọzọ bụ nchefu ihe mere nsonso a, nchefu aha ha nakwa ebe ha nọ. Ha na-efukwa n'ebe ha magbu mbụ maọbụ chefuo okwu ha bụ n'uche ma ha na-enwe mkparịtaụka. Ihe ndị so eme ka ọrịa bawanye bụ na ndị mmadụ na-ebizi ogologo ndụ; ha anaghị anwụ n'oge Ọgwụgwọ Dementia O nweghi ọgwụgwọ eji aka maka ọrịa dịka ndị nnyocha sayensị na-agbasị mbọ ike ịrụpụta ọgwụ ga-akwụsị ya. Ya mere na achọtabeghị ihe jikọrọ 'amyloid' na ọrịa Dementia. Nke a pụtara na ndị nnyocha sayensi ka nwere ụfọdụ akụkọ gụnyere: - Gịnị na-egbu 'neurons' n'ụbụrụ - Kedụ ụdịrị 'protein' na-ejupute n'ụbụrụ - Ha kwenyere na achọta asịsa ajụjụ ndị a, ọ ga-eme ka achọta ọgwụgwọ ọrịa ahụ ngwa ngwa O doro anya na enwebeghi ọgwụgwọ maọbụ ọgwụ mgbochi Dementia mana ndị dọkịnta na-ekwukwa na o nwere ihe ndị mmadụ nwere ike ime iji gbochi ya. A mabeghi ihe jikọrọ omume ndị a na ọrịa 'dementia' mana nnyocha ka na-aga n'ihu." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58542851 +politics Xi Jinping ewerela oche ọchịchị mba China nke ugboro atọ "Xi Jinping nke mba China etiwaala akụwaala ihu akwụkwọ dịka o weere oche ọchịchị mba ahụ nke ugboro atọ n’otu usoro. Nke a mere o jiri bụrụ onye ndu kachasị akpa ike na mba ahụ kamgbe ọchịchị Mao Zedong. Onye ndu pati ha bụ Shanghai Communist bụ Li Qiang so Xi gbagoro n’ọgbọ dịka ha kpọpụtara ndị ndu mba China ọhụrụ. Ndị ndu ndị ọzọ a gụnyere; Zhao Leji, Wang Huning, Cai Qi, Ding Xuexiang na Li Xi. Akụkọ sị na ndị ndu niile a bụ ndị na-erubere Xi Jinping dị afọ iri isii na itoolu isi ma bụrụkwa onye ndu ndịagha mba China a kpọrọ ‘Central Military Commision. Ihe gbapụtara ihe na nhọpụta ndị ọchịchị ndị a bụ na otu mkpụrụ nwaanyị nakwa ndị ntoroọbịa esoghi na ha. Nhọpụtagharị Xi nke ugboro atọ na-abịa dịka pati mechara ọgbakọ n’ụbọchị Satọde nke e jiri hiwe  ngalaba ‘Politburo Standing Committee’, gụnyere ya na mmadụ isii ndị ọzọ. Xi kelere ndị pati ya maka “ịtụkwasị ya na ndị obi ọchịchị ya obi”. Ọ gara n’ihu kwuo ""anyị ga-agba mbọ ime ka China bụrụ mba kwụụ chịm n’ụwa, nke a ga-eji na-ama atụ.""" https://www.bbc.com/igbo/articles/cd1v2r2rvgvo +health Madagascar Coronavirus: Gịnị dị n'ime ọgwụ ọhụrụ a azụtara na Madagascar? "Dịka gọọmentị Naịjirịa nyere iwu ka a tụbata mgbọrọgwụ nke e mepụtara na mba Madagascar iji gwọọ ọrịa coronavirus, ọ bụrụla akụkọ na-ewu ewu ebe niile. Ụfọdụ mmadụ dịka otu onye Dọkịta bụ McGinger Ibeneme kwuru na ọ ga-adị mma itule ya bụ ọgwụ dịka Minista ahụike bụ Osagie Ehanire si kwuo. O kwuru nke a n'ihi na n'ọnụ ya ""Coronavirus anyụọla mbaụwa niile ịkpakwụ"" ya mere a ga-eji chọọ ọgwụgwọ ọsịsọ. Ngalaba ahụịke bụ World Health Organisation (WHO) na-adọkwa aka na ntị ka e mee ọgwụ ahụ nnyocha mara ma ọ ga-adị mma n'ime ahụ mmadụ tupu e nye ya onye bu ọrịa a. Kedụ ka o si atọ? Lee ihe anyị ma:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-52631191 +politics Lee ka akwamozu aka chibụrụ Kenya bụ Mwai Kibaki si aga "Gọọmentị mba Kenya na-eme emume akwamozu aka chibụrụ Kenya bụ Mwai Kibaki ,onye lara mmụọ n'otu izu gara aga taa bụ Fraịde (29/4/22). Kibaki nwụrụ ka ọ dị afọ iri itoolu. Ozu ya hapụrụ ụlọ olili ozu n'ụtụtụ taa ma gawa obi gọọmentị dịka ụgbọala ndị agha so chiri ya bụ ndị na-eduzi usoro olili ozu ahụ. Ọtụtụ ndị isi mba Afrịka nakwa mbaụwa ndị ọzọ ga-abịa emume a, nke gụnyere Cyril Ramaphosa nke South Africa, Salva Kiir nke South Sudan na Sahle-Work Zewde nke Etiopia ndị kwupụtarala nkwenye ha na ha ga-abịa. A na-eme mmemme a n'ama egwuregwu Nyayo dị na isiobodo Kenya bụ Nairobi. Emechiela nnukwu okporoụzọ dị Nairobi iji mee ka ọ dịrị ndị na-abịa ya bụ emume mfe ibanye ama egwuregwu ahụ. Ndị agha mba Kenya na-eme usoro ngagharị pụrụiche dịka ha na-aga n'eme mmemme a. Ndị mba Kenya nọ n'ahịrị ugbua maka ịkwanyere Mwai Kibaki ugwu ikpeazụ ha nke malitere kemgbe ụbọchị Mọnde, bụ ebe a na-ekiri ozu ya nke ikpeazụ n'obi gọọmentị nke ndị ụlọomeiwu dị na steeti. Gọọmentị Kenya ekwuola na taa bụ Fraịde bụ ụbọchị ezumike nye ọha iji nye ha ohere iru uju nakwa inwe ike bịa ya bụ emume. Mba Tanzania bụ mba agbataobi Kenya ekwupụtala ụbọchị iru uju ụbọchị abụọ site na Fraịde iji kwado ndị Kenya. Cheta na a dụrụ Kibaki iyi ọrụ dịka onyeisiala nke atọ na mba Kenya n'ebe ngwụcha afọ 2002, ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisiala ruo n'afọ 2013. A ga-eli ya n'ụbọchị Satọde n'ụlọ ya dị na mpaghara etiti Kenya. Mwai Kibaki bụbụ onyeisiala mba Kenya nwụrụ n'izu gara ka ọ gbachara afọ 90. Onyeisiala mba ahụ bụ Uhuru Kenyatta bụ onye gbara ama nke a ụbọchị Fraide. Kibaki bụ onye ndu mbụ na esighị n'otu 'Kenya African National Union (Kanu), bụ pati chierala afọ 40 kemgbe Nnwereonwe mba ahụ. E ji iwulite akụna mba ahụ mara Kibaki onye chịrị Kenya malite n'afọ 2002 rue afọ 2013. Mana mmeri o ji laghachi n'okwa site na ntuliaka afọ 2007 butere tigbuo-zogbuo nke tara isi mmadụ 1200. Kenyeta kwuru sị, ""Mwai Kibaki bụ onye a ndị ala anyị a hụrụ n' anya ma na-akwanyere ugwu."" ""Ọ bu ụzọ n'ịhụ na pati nọ n'ọchichị kwụ n'ụkwụ ha site na ịcha ha ọkụ.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-61186264 +entertainment Bob Marley: Ihe o ji bụrụ eze 'Raggae' "Bob Marley bụ odogwu nwoke ji egwu na nka gbanwee omenala nakwa echiche na nkwenye ndị mmadụ n'ụwa gbaa gburu gburu. Kemgbe ọ nwụrụ n'ụbọchị iri na otu ọnwa mee afọ 1981, ude, ebube na ọrụ ọma ya malitere ịgbasa karịa ka ọ dị mgbe ọ dị ndụ. Ihe buliri ya elụ otu a bụ ọrụ ọma ya n'iti egwu nke o ji ekwupụta mmegbu, mkpagbu na uru ọ bara mmadụ ileghere ahụhụ ụwa anya, nwewe aṅụrị bụ nke ọ ọkụrụ na egwu mgbe ọ sị, ""forget your troubles and dance"" . Ọ gbasakwara ozi ihunanya nke ukwu bụ nke o gosiri na egwu ya bụ ""One Love"". Ị ji mata nke a, mgbe ọ nwụrụ ka e ji nye ya nturuugo ""Rock and Roll Hall of fame"" n'afọ 1994. Na 1999 ka Times Magazine ji nye egwu ya nke ọ kụrụ n'afọ 1977 a kpọrọ ""Exodus"" nturuugo ọbaegwu bụ ọkaibe na narị afọ, ya bụ ""Album of the Century award"". N'otu aka ahụ ka ha ji nye egwu nke ọ kpọrọ ""One Love' ""Song of the Millenium"". Kemgbe o wepụtara albọm ahụ ọ kpọrọ ""Legend"" n'afọ 1984, ya bụ egwu na-ere ihe karịrị narị pụkụ abụọ na iri ise (250,000) kwa afọ, nke tinyere ya n'ọkwa iri na asaa egwu merela etu ahụ kamgbe ndị 'Sound Scan' malitara ịgụkọ egwu mere nke ọma n'afo 1991. N'afọ 2001 ka e nyere ya nke kacha nke bụ ""Grammy Liftime Achievement Award"" bụ echichi a na-echi naanị ndị bụ ochiedike n'egwu. Ihe ndị niile mere Eze Ndu, onye malitere na nwata kpọwa egwu Bob Marley ji sị na ""ọnwụ ya bụ nwaamadị dịka ọnwụ Jesus Christ maka na ndị mmadụ chọpụtara uru ọ baara n'ọnwụ ya"". Eze sịkwa na ""Bob Marley bụ mmụọ, bụrụkwa mmadụ"". Ọ kọwara na ya bụ nwaamadị ji ahụhụ nne ya tara dịka onye isiojii were mara ahụhụ ndị ọzọ na-ata n'obodo ya bụ Jamaica wee si otu ahụ gbawara mmadụ niile ọgọ site n'egwu ya pụrụiche a kpọrọ Reggae. Eze sị na ""mụ na onwe m na-ahụ Bob Marley ka mụọozi bịara n'ụdị mmadụ izi ozi maka ọdịmma mba Afrịka"". Ọ sị na ""mgbe Bob Marley dị ndụ, ndị be anyị amaghị na ọ bụ onye amụma. Ọ bụ mgbe ọ nwụrụ ka a bịara chọpụta n'ezie na ọ bụ onye ammụma"". Dịka o si maa atụ, ""ncheta a na-echete Bob Marley dịka nchete ndị otu krịast na-echeta ya maka ọ mere ka ọtụtụ n'ime anyị chọpụta ihe anyị amaghị gbasara ndụ anyị na-ebi, gbasara ka e si kee anyị n'ụwa a na mmegide a na-emegide anyị nakwa nkata dị iche iche bụ nkata ọjọọ ndị ọcha kpara megide ndị isi ojii"". Eze sị na Bob Marley mere ka ndị isi ojii mara ka anyị bụ ndị isiojii ga-esi jikọ onwe anyị ọnụ. O wutere Eze na onwebeghị ebe ọbụla n'ala igbo eji aha Bob Marley gụọ okporoụzọ dịka e si eji aha ndị ọzọ. Ọ rịọrọ ndị isi ọchịchị, ọkachasị n'ala Igbo ka ha kawa ahụ nwere aha ya gụọ okporoụzọ dị mkpa maka ncheta ya bụ odogwu nwoke. Bob Marley chọpụtara na-ọnwere ọrịa Kansa na mkpuru ukwu ya na 1977. Ya na ya bụ ọrịa gbagidere mgba ruo 1981 bụ mgbe ọ nwụrụ na ụlọọgwụ dị na Miami n'ọnwa Mee afọ ahụ. A mụrụ ya n'ụbọchị isii ọnwa febụwari 1945. Marley mụrụ ụmụ iri na abụọ nke gụnyere ụmụ nwoke asaa na ụmụnwaanyị ise. Damian bụ nke mbụ, Ziggy sowe ya. Nke ikpeazụ bụrụ Robert. Nke a bụ afọ iri atọ na itoolu Bob nwụrụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52609849 +entertainment Boxing Day: Ọ bụ ụbọchị e ji akụ ọkpọ? Mbido 'Boxing Day' edoghị anya, mana a na-ekwu na 'omenala' bidoro n'ụka oge gboo, oge ndị ụka ji igbe anatakọta ego e ji enyere ndị mmadụ aka. Ngwugwu ndị mmadụ na-atụkọ a na-atọpe ya ụbọchị Disemba 26, ụbọchị ncheta onye nso Stephen bụ onye mbụ e gburu maka ikwenye na Kraist. Mana amara ndị mba Briten dịka ndị bidoro were ụbọchị Disemba 26 dịka ụbọchị ezumike. Ha na-enye ndị na-agbara ha odibo maọbụ ndị na-arụụ ha ọrụ ezumike ma nyekwa ha ihe onyinye. Omenala mechara gbasaa na mba ndị ọzọ dịka Canada nakwa Australia. Na Naijiria, ụfọdụ na-eche na emume a metụtara ịkụ ọkpọ. Boxing Day bụ ụbọchị na-esote ụbọchị ekeresimere bụ abalị December 26 ọbụla. Ụbọchị ahụ na-abụkarị ụbọchị ezumike na Naịjirịa nakwa ụfọdụ mba ndị ọzọ. Ọ bụrụ na December 26 dabaa n'ụbọchị dabaa ụbọchị satọde maọbụ Sọnde, a ga-eme Tuesde na-abịanụ ụbọchị ezumike ma mekwa ụbọchị Mọnde ezumike. Ụmụ Naịjirịa na-ejikarị ụbọchị ahụ ezuike dịka ha ji ụbọchị ekeresimesi sie ọtụtụ nri. Ha jikwa ya erikwa ọtụtụ nri ndị ọzọ dịka ndị ezinụlọ ha nakwa agbataobi ha butere ha iji kelee ha maka mmeme ekeresimesi. Ụfọdụ na-ejikwa ya eme mkpagharị nlegharị anya maọbụ kirie mmọnwụ n'ala Igbo. Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-46686698 +business Onitsha Port: Usoro ị ga-eji esi osimiri Onitsha ebubata ibu "Dịka onyeisi ngalaba National Inland Waterways Authority bụ George Moghalu kwuru na Onitsha adịla njikere ibubata ibu site na mmiri Onịcha, ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ kedu ihe ọ ga-ewe ha ibubata ibu site na mmiri Ọnịcha. N'agbanyeghị na ọ bụ n'afọ 2021 ka ọdọụgbọmmiri a ga-ebido rụwa ọrụ, Moghalu kwuru na ha chọrọ ka o bido ọrụ tupu oge ha kwere na nkwa eruo. Moghalu kwuru na ha esila ọdọ mmiri Onne dị na Rivas steeti buru ibu bata Onitsha ma burukwa ya laghachị Onne iji tulee ọdọụgbọmmiri Onitsha; ma ihe niile gara nke ọma. Austin Okwaeze Nwosu bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi nke ndị Association of Nigerian Licensed Customs Agent akọwala ihe o nwereike ifu onye chọrọ ibubata ibu site na mmiri Onịcha. O ji ịtụbata ahụ ụgbọala nke bụ spare parts na bekee were maa atụ, Lee usoro ya ebe a : 1) Onye ahụ ga-aga ụlọakụ ya mepee 'Form M'. 2) Ọ bụ Form M a ka ọ ga-eji zụta ahịa 3) Ọ bụ form M a, Invoice na ihe ndị ọzo o jiri zụo ahịa ka a ga-eji mepee PAR 4) PAR bụ ""Pre Assesment Release"" bụ akwụkwọ na-egosi ahịa ole ọ zụrụ. 5) Akwụkwọ PAR a, ngalaba ndị gụnyere Customs,Mịnịstrị nke ego, SON, ndị Federal Inland Revenue dgz 6) Ị ga-enye onye ga-agbapụta ibu gị PAR na Bill of Lading nke ndi ebe ịzụru ahịa nyere gị. 7) Onye na-agbapụta ahịa ga-eji Bill of lAding wepụta ya n'aka ụgbọ bu ibu ma were PAR gwụọ ụgwọ nke ndị ngalaba Customs. 8) Mgbe ibu rutere ọdọ ụgbo mmiri dịka nke Onne, ị ga-akwụ Shipping charges, kwụo Terminal Charges. 9) onye ahụ ga-akwụ ụgwọ ụgbo mmiri a na-akpo Barge ga-ebubata ibu ya n'Onicha. 10) Mana onye ahụ nwereike ịkwụ ụgwọ Customs n'Onne maọbụ na nke Ọnịcha 11) O kwukwara na ndị nchekwa nke Customs ga-eso ya bụ ụgbo mmiri barge were gawa Onịcha. Dịka ego eji ebubata ihe dị iche iche, Nwosu kwuru na ego eji ebite ụgbọ mmiri Barge di ndala ọnụ. Ọ mara tụ na isi na ọdọ mmiri nke dị na Apapa Legos buru kọntena buga ọdo ụgbo mmiri nke dị na kirikiri legọs ruruNaira narị puku abụo na iri ise. O kwuru na o ga-adị mkpa ka etinye anya n'ụgwọ ndị barge na-ana. Moghalu rụtụrụ aka n'ụfọdụ uru ọdọgbụmmiri a ga-aba nke gụnyere; Ụfọdụ ndị na-azụ ahịa n'Ọịcha kọwara etu ọdọụgbọmmiri Ọnịcha a ga-esi baara ha uru. Silas Odo bụ onye na-azụ ahịa akwa n'Ọnịcha kwuru na ya bụ ọdọụgbọmmiri ga-eme ka ibubata ahịa dịrị ha mfe. Ọ sị na ka na-anụ ya dịka akụkọ na ọ bu mgbe o bidoro ịrụ ọrụ ka ha ga-ekwete. Kedụ ebe ọdọụgbọmmiri Ọnịcha a dị kpọmkwem? Ọdọụgbọmmiri a dị n'ebe a na-akpọ 'Ọgbọ osisi' dị n'Ọnịcha, Anambra Steetị n'akụkụ Akwammiri Naịja, Onye na-achịkọta Onitsha River Port bụ Baba Spencer kwuru na ihe niile ọdọụgbọmmiri Onitsha ga-eji rụo ọrụ zuru ezu. O kwuru sị ""mgbe ọdọụgbọmmiri a bidoro ọrụ, ọ ga-ebelata ego e ji ebubata ibu na ndị mmadụ site n'Onitsha gawa ebe ndị ọzọ na Naịjirịa"". O kwuru sị ""ọ bụ n'afọ 1983 mgbe Shehu Shagari nọ n'ọchịchị ka a rụrụ ọdọụgbomiri a, mana a hapụrụ ya ruo mgbe Goodluck Jonathan kpalitere nruzi ya site n'afọ 2012"". Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-54445868 +entertainment The Experience 13: Lee ka Don Moen na otiegwu ndị ọzọ na-asụ Igbo "Ndị otiegwu bịara emume ""The Experience"" kọwara onwe ha n'Igbo, ma ndị isi ọcha ma ndị isi ojii. Ndị a gụnyere Kirk Franklin, Don Moen, Chioma Jesus, Tim Godfrey na ndị ọzọ. Ha gosipụtara mma dị n'ịsụ asụsụ Igbo. Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho" https://www.bbc.com/igbo/afirika-46488392 +sports Everton vs Arsenal: Ljungberg emeela ike ya mana ozughị Ihu atọghị ndị nkwado otu egwubọọlụ Arsenal na Everton ọchị taa ka otuegwu bọọlụ abụọ ahụ gbara ọnyụpa na Premie Lig ụbọchị Satọde. Agbanyeghị, ndị otu abụọ ahụ nụrụ ọgu ka agụowuru abụọ meruru ahụ ebe ọgụgụ sị na ndị Arsenal jidere bọọlụ ihe ruru 57% ebe Everton ji ya 43%. Asọmpi a bụ nke mbụ nke ikpeazụ Freddie Ljungberg ga-eji nyere Mikel Arteta ohere dịka onyeis nkuzi ndị Arsenal. Otu ekwubọọla abụọ agbaghị aka ahịa site na mbido ya bụ egwuregwu ruo na ọgwụgwụ ya nke bụ na ụfọdụ che na ọ bụ ya bụ asọmpi kacha njọ kemgbe agbawara Premia Lig. Ihe atụrụ anya n'aka Mikel Arteta karịrị akarị ọkachasị ikpogote Arsenal n'ogogo Premia Lig bụ ebe ha na-agba ndị nke itoolu. Onye jigodi oche onyenkuzi ndị Everton bụ Duncan Ferguson na-aja onwe ha ike na-ekwu na ha mere ike ha ịhu na Arsenal emerighị ha n'ụlọ. Nke a bụ ugboro atọ emeribeghị ha n'asọmpi. Obi juru ya afọ maka ihe ndị otu ya gbara taa, agbanyeghị na ha emerighi, ebe ọ na-atụanya ịnabata onye ndụ ọhụrụ ha bụ Carlo Ancelotti echi. Egwuregwu a ka ndị na-anọchite anya ndị nkuzi otu abụọ a bụ Freddie Ljungberg na Duncan Ferguson ga-eji nyere ndi isi ha efe n'oche. Ndị nkuzi abụọ a nọkwanụ n'ụsọ ekiri ihe ndị otu ha mere n'ọgbọ bụ ebe ha ga-anọ mara ihe ha ga-eme iji mee ka ọnọdụ ha gbagote. Ọnweghị ndị nwere ibe ha goolu ka ya bụ asọmpi gwuchara. https://www.bbc.com/igbo/50879629 +health Coronavirus Updates: Coronavirus ọ na-egbu ndị ojii? Coronavirus amaghị onye dị ọcha maọbụ ojii. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Chimezie Ucheagbo na Chukwunaeme Obiejesi https://www.bbc.com/igbo/afirika-52069589 +sports Manchester United vs Chelsea: E gosila Man Utd na onyeisi nkwọcha anaghị aga ọgụ okwute Otu egwuregwu bọọlụ Chelsea ejirila iwe mekpaa ndị Manchester United ahụ oge otu abụọ a zutere onwe ha na mgbede ụbọchị Sọnde. Ọkpụ goolu atọ a satara otu ka ha ji merie ha ma gafee n'agba ikpeazụ nke iko FA. David De Gea bụ okwu a kpụ n'ọnụ n'asọmpi a n'ihi aka mbe o chere ugboro ugboro nke mere e ji merie ndị Man Utd. Olivier Giroud na Mason Mount nyeteere Chelsea goolu ebe Harry Maguire ji aka ya gbakpuo bọọlụ na neetị ndị Man Utd iji mezuo ya ọkpụ atọ. Bruno Fernandez ji penariti nyetere Man Utd otu mkpụrụ goolu nke ha ji gbaa aka ahịa. Ọ bụzị na Chelsea na Arsenal ga-agba asọmpi nke a gbachaa e buru n'iko FA. Cheta na Arsenal nyụrụ Manchester City ịkpakwụ n'ụbọchị Satọde. Ọkpụ abụọ asataghị asata ka Arsenal ji merie Man City. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-53467193 +politics Orlu Imo State: Ọ bụ anyị kpọrọ ndị agha oku enyemaka - Gọọmentị Imo steeti "Onye na-achị steeti Imo steeti bụ Hope Uzodima ekwuola na ọ bụ gọọmentị ya kpọrọ ndị agha Naịjirịa bịa nyere ha aka kpochapụ ndị echeere na ha so n'otu Eastern Security Network O kwuru na ọ bụ ndị otu ipob bụ ndị kpara nkata ịwakpo obodo Orlu n'aha ịchọ ndị ọchiechi na mpaghara ahụ. Ozi a bụ nke si n'aka Kọmịshọna na-elekọta ikpe ziri ezi bụ Cyprian Akolisa gwara ndị ntaakụkọ nke a mgbe ọ na-aza ajụju gbasara ihe ndị agha na-eme n'Orlu. ""Mwakpo e mere ụlọ ndị uweojii dị ịcheiche mere n'oge #endsars bụ ndị otu ipob zoro n'okpuru ngagharịiwe ahụ iji zuru ngwa agha"" ka o kwuru BBC Igbo agaala Lilu nke dị n'okpuruọchịchị Ihiala n'Anambra steeti iji mme nchọpụta nke bụ eziokwu maka mkpamkpa kpara n'ụbọchị Weneezde, abalị iri na itoolu nke ọnwa Febrụwari 2021. Cheta na akụkọ na-efegharị na ndị agha Naịjirịa ji ụgbọelu ha na-akwa mgbọ n'Orlu ebe ha na-achụ ndị otu Eastern Security Network. Nchọpụta BBC Igbo gosiri na ọ bụghị na Orlu ka ihe a mere kama o mere n'obodo Lilu. Ndị agha Naịjirịa kwuru na ha zigara ụgbọelu ha na mpaghara ahụ n'eziokwu mana o nweghị ndị ha nyere nsogbu. Mana BBC Igbo chọpụtara na ndịagha ji ụgbọelu ha gbaa ogbunigwe ma kwaa mgbọ n'okirikiri ahụ. Otu nwoke kpọgharịrị ndị ntaakụkọ BBC Igbo na be ya ma gosi ha etu ogbunigwe ndịagha si gbarie akụkụ ụfọdụ na be ya. Nwoke ahụ gosiri anyị ọnụụzọ ama ya nke bekee na-akpọ gate, elu ụlọ ya (roof), elu ụlọ nke ime (celiene) nakwa akụkụ ndị ọzọ ndị agha kwara mgbọ. O kwuru na ọ bụ naanị amara Chineke mere na onweghị onye nọ n'akụkụ ebe mgbọ ndị ahụ nakwa ogbunigwe ndị ahụ dara. BBC ga-ewetara gị akụkọ a n'uju ya ma anyị chịkọtachaa mpụtara nchọpụta ndị ntaakụkọ anyị gara ime n'obodo Lilu. Orlu na-ewu na soshal midia ugbua dịka ọtụtụ na-ekwu na ndị agha Naịjirịa awakpola obodo ahụ ọzọ. Cheta na ndị agha na ndị ọrụ nchekwa Eastern Security Network kwataburu n'Orlu n'oge gara aga. Mana n'ụbọchị Tọzde, Febrụwarị 18, 2021 ka akụkọ nakwa onyonyo malitere ifesa nke na-ekwu na ụgbọelu helịkọpta nke ndị agha Naịjirịa na-akwa ndị mmadụ mgbọ na mpaghara Orlu. Oda Chioma, onye bi n'Orlu gwara BBC Igbo na enweghi ihe gbara gharịị na-eme na mpaghara ebe o bi. O kwuru na ndị agha ka nọ ebe niile mana o nweghi onye ha na-enye nsogbu. BBC Igbo jụrụ Igwe Dr Patrick Acholonu, onye a ama ka Didikadi ndị Orlu, o kwuru na ndị agha ka nọ ebe niile mana o nweghi onye ha gbara egbe ma tụọ mgbọ. Onye ọzọkwa na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ya anụbeghị ụda egbe n'okirikiri nke ha. O kwuru sị: ""Anyị na-ahụ helịkọpta ka ọ na-efegharị, ndị soja jukwara n'okporo ụzọ, mana udo dị. Anyị anụbeghị ụda egbe n'ogologo oge."" Ọ gara n'ihu kwuo na ụfọdụ na-akọ na ha nụrụ ụda egbe na mpaghara Okporo Orlu, mana n'akụkụ nke ha, ebe niile dị jụụ."" Ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa, ngalaba 34 artillery Brigade nke dị n'Obinze, Owerri, Imo steeti, bụ Babatunde Zubairu, gwara ụlọntaakụkọ Punch na ha zigara ụgbọelu helịkọpta na mpaghara Orlu. Zubairu kwuru na ọ bụ n'ihi nchọpụta ha mere, nke bekee kpọrọ 'military intelligence', ka ha ji ziga ụgbọelu ndị ahụ. Onye ọzọkwa bi n'obodo Uda, Orsuihiteukwa nke dị n'okpuru ọchịchị Orlu, gwara ndị Punch na ụgbọelu ndị agha na-efegharị n'obodo ha nke tinyere ọtụtụ mmadụ n'ụjọ. Mana onye ahụ kwuru na helịkọpta ahụ agbaghị egbe ọbụla. O kwukwara na ya bụ helịkọpta fegharịchara ma fepụkwa. Onyonyo dị icheiche na-agbasa na Twitter na-egosi ụgbọelu helịkọpta na-efegharị nke ndị mmadụ na-asị na ọ na-akwa mgbọ na-agbagbu ndị mmadụ. Chidi Odinkalu, onye jibu ọkwa onyeisioche 'National Human Rights Commission' tinyere otu ihe onyonyo na Twitter ebe ọ dịka Helịkọpta na-agba egbe. Aisha Yesufu, onye a ma ama na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye, kwukwara otu ihe ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu gwara BBC Igbo n'ekwentị na ya amaghị maka akụkọ a na-efegharịnụ. O kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ akpọkwaala ya maka ya bụ ihe. Ikeokwu gara n'ihu kwuo, na o doro ya anya na ndị agha ka nọ na mpaghara Orlu, mana onweghịzi ndị ha na-enye nsogbu. Mana anyị na-agba mbọ ịnụ n'ọnụ ndị bi na mpaghara ahụ ka ha kọwaara anyị ihe na-emenụ. N'aka nke ọzọ ụlọọrụntaakụkọ Punch Aka chịburu Imo steeti na onye bụ Sinetọ Imo West bụ Rochas Okorocha, onye nnọchiteanya ndị Orlu Imo State gara ebe ahụ, ka ọgbaghara dapụtara na ya biri. Ọ gwara ndị isi obodo na ndị bi n'Orlu ka ha jikọọ aka hụ na ọgbaghara dapụtara n'Orlu nke tara isi ọtụtụ mmadụ ma mebiekwa akụnaụba ndị mmadụ ghara ime ọzọ. O kwuru nke a mgbe ọ gara njem nleta nakwa iti aka n'obi na nke Eze Boniface Okereke so na ndị ihe metụtara. O hibere kọmiti mmadụ asaa ga-elebanye anya n'ọdịmma ndị ihe a metụtara ma nyekwa ha enyemaka ego na ihe ndị ọzọ ha chọrọ. O nyekwara ụm��aka niile nne maọbụ nna ha nwụrụ n'ọgbaghara ahụ onyinye agụmakwụkwọ n'efu. Ndị ọzọ ọ letakwara bụ ndị si mba Naịja nakwa ezinaụlọ ndị ọzọ ihe a metụtara. N'ọnụ ya ""Obi gbawara m mgbe nụrụ maka ihe mere ebe ụfọdụ ndị mmadụ gụnyere ndị nche tufuru ndụ ha, Ọ bụ ihe ọjọọ mere n'Orlu nke m katọrọ kpam kpam"" Nnamdi Kanu gwara ndị ESN wụsa ọwa n'Orlu Nnamdi Kanu bụ onyendu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ ndị na-achọ nnwereonwe Biafra nakwa otu Eastern Security Network (ESN), agwala ha wụsa ọwa n'Orlu. Nke a na-abịa dịka o kwuru na ọ nụrụ na a gwala ndị agha na ndị uweojii e zigara obodo ahụ mgbe ọgbaghara dapụtara si ebe ahụ pụta. Kanu gara n'ihu kwuo na ESN laghachị n'ịgbado anya n'ịhe gbasara nsogbu ndị ọchị ehi n'obodo ahụ. Kedụ ọnọdụ Orlu nọ n'ime ya ugbua kemgbe ndị agha na ndị a na-eche na ha bụ ndị Eastern Security Network (ESN) kwatachara? BBC garuru obodo ahụ iji anya ha hụ ka ihe dị ugbua. Eze dkt. E.C. Okeke gwara BBC Igbo na ndị mmadụ anaghị agagharịcha etu ha si emebu mbụ. Taa bụ ụbọchị Tọzde ga-eme ya alabị atọ kemgbe amachiri ngagharị ma nọchie ụzọ e si abanye obodo Orlu. Onye ntaakụkọ BBC ka nọkwa ebe ahụ ahụta ka o si aga nakwa etu ndị mmadụ nọ ebe ahụ si ebi. Ọ gwakwara Igwe obodo ahụ okwu ịchọpụta ihe mere. Lee ya ebe a: BBC Igbo chọpụtara na ọpụpụ na mbata n'obodo Orlu adịghịzị mfe. O kwuru na ndị agha na ndị uweojii nọchiri ebe niile iji kwụsị ndị mmadụ ọpụpụ na mbata. Ihe ọzọ bụ na mmachi ngagharị nke gọọmentị steeti ahụ ka dị mana o nweghi onye ma mgbe ọ ga-ebi. O kwukwara na rue ụbọchị taa, ụda egbe ka na-ada n'obodo ahụ Ụjọ ka ji ndị mmadụ ịpụta mbara Orlu tọgbọọ chakọọ tata dịka ndị mmadụ n'eze isi onwe ha. Nsogbu ahụ dapụtara n'etiti ndị ọrụ agha na ndị Ipob n'Orlu, Imo steeti ka na-agakwa n'ihu ugbua. BBC chọpụtara na okporo ụzọ nakwa obodo dị iche iche n'Orlu dịka Amaifeke, Okporo na Banana junction dịka ebe agbara ọsọ n'ọdụ ahịa, ụlọ akwụkwọ na ụlọ ọrụ niile gbachiri agbachi. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu ekwuola na ụfọdụ mmadụ pụtara ụnyahụ bụ Jenụwarị 26,2021 wakpoo ogige ndị Hausa bi n'Orlu ma gbuo ndị agha anọ. O kwuru na nke a mere ka ndị agha wuchie ebe ahụ . Ọ gara n'ihu kwuo na ya ejichaghị akụkọ zuruoke gbasara ya bụ mkpa mkpa kpara n'Orlu ụnyahụ. O kwuru na ka ihe si kwụrụ n'ụtụtụ a, udo alaghachitela ebe ahụ dịka ụfọdụ ndị otu ya nọ ebe ahụ ugbua. Orlando kwuru na mmachị ngagharị ka dị n'Orlu ugbua. Anyị ka na-ege ntị ịnụta n'ọnụ ya gbasara ọdachị a. Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu etinyela ọnụ n'okwu gbasara ihe na-eme n'Orlu ma kwuo na ""Orlu agaghị abụ Obigbo ọzọ"". O ji Obigbo nke dị na Rivas steeti ebe echeere na ndị agha gburu ndị mmadụ n'ụzọ ezighi ezi were amaatụ n'ihe na-eme n'Orlu. O kwukwara na ọ ga-aga n'ihu ị me ihe ọ na-eme rue mgbe akpọrọ ya oku na ""Hague"". Hague bụ ebe ụlọikpe kachasị na-ekpe ndị omekome n'ụwa niile ikpe nọ, ọ dị na mba Netherlands. ""Nwụchie nu ndị aka ha dị n'ọgbaghara a"" - Hope Uzodimma Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma etinyela mmachị ngagharị n'obodo Orlu dịka ọgbaghara dapụtara n'ebe ahụ. Amabeghi mgbe mmachi a ga-ebi mana o ga-esi n'abalị rue n'ụtụtụ. Uzodinma n'ozi ziputere kwukwara na obi adịghị ya mma maka ogbugbu na ọgbaghara ahụ dapụtara. O zikwara ndị ọrụ nchekwa ozi ka ha nyoo anya n'ala chọpụta ndị aka ha dị n'ogbugbu a. Ebe ndị mmachi a metụtara bụ Ihe anyị ma maka ihe na-eme n'Orlu Akụkọ na-efegharị na-ekwu na ndị nọ n'Orlu agbaala ọsọ ndụ dịka otu amaghị ndị ha bụ na ndị echere na ha bụ ndị agha Naịjirịa na-akwa mgbọ. Otu onye nọ ebe ihe mere aha ya bụ Chimezie kwuru na ọ gbapụrụ na be ya gbalaga obodo ọzọ dị nso n'ebe ahụ. O kwuru sị ""ụzọ abụọ banyere n'ime ogbe ebe m bi bụ ndị agha nọchiri ya, ha hiri nne ju ebe niile"" Onye ọzọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ bụ Precious kọwara ihe anya ya hụrụ n'ụzọ Orlu taa. O kwuru na ọ nọ n'ụzọ a ga Orlu mgbe mmadụ ụgbọala anọ bụ ndị mmadụ na-agbali egbe elu zutere ha n'ụzọ. O kọwara na mmadụ niile nọ n'ụzọ ahụ gbahapụrụ ụgbọala ha mgbe ha hụrụ ihe na-eme. Precious kwukwara na ọ maghị otu bụ otu ahụ na-agbli egbe elu. Mgbe BBC kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu, o kwuru na ọ nọ na nzụkọ ma sị anyị kpọghachi ya. Kedụ etu ọgbaghara a si bido? Otụ onye na-achoghi ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na oruola izu ụka abụọ ọ bidoro ịhụ ụmụ okorobịa bu ngwa ọgụ na anọkari n'ime ụgbọala na-agbali egbe elu ka ha na-agbafe n'orlu. Ọ kwuru na ndi a na-eyikari uwe ojii na okpu na-achaa mmemmé. Ha nwere-ike ịbụ ụgbọala Sienna, hilux maọbụ jeep. Ọ kwuru na ndị a anaghị achọ ndị obodo okwu kama ha na-awakpo onye ọrụ nchekwa Obula ha hụrụ n'ụzọ. Ọ kwukwara na egbe nke a gbara taa na ha gbara ya gbatee ya aka. Ọ kwuru na enweghị onye ma ndi ha bụ. Ọ kwuru na ụbọchị olee gara aga ka ndị agha gara obodo ụmụtanze bụ ebe ndị a si aputa, were nwuchie ma gbuo kwa ụfọdụ ụmụ okorobịa ha jidere. Kama ọ kwuru na ọ bụghị ndị a ka ndị agha ahụ jidere. Ọ kọwara na ndị agha gbara keke ụfọdụ ndị mmadụ ọkụ dika ndi agha na-ekwu na egburu otu onye otu ha n'obodo ahụ. Onye akaebe a kwuru na ndị nọ n'obodo Umutanze agbaala ọsọ ndụ ha. Ma sikwa na ya bụ ogbaaghara na ha abanyela obodo ndị ọzọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56114163 +politics Okwu ịkwado Peter Obi ka ọ bụ Tinubu etinyela ọgbaghara n'otu Afenifere "Okwu ma a ga-akwado onye na-efe ọkọlọtọ otu Labour Party na ntuliaka onyeisiala n'afọ 2023 bụ Peter Obi, ka ọ bụ nke otu APC bụ Bola Ahmed Tinubu, etinyela ọgbaghara n'otu jikọrọ ndị Yoroba a kpọrọ, Afenifere. Nke a bụ dịka onye bụbu onyeisi otu ahụ bụ Pa reuben Fasoronti, mara ọkwa na ọgbakọ otu ahụ nke a na-emebu n'ụlọ Pa Ayo Adebanjo bụ onye nọ dịka onyeisi otu ahụ ugbua agaghị adịkwa etu ahụ. Akwụkwọ 'Nation' kwuru na Fasoranti gbara ama na nsonso a na nzụkọ ahụ ga na-adịzị n'Akure, isi obodo Ondo steeti, bụ ebe o bi. Cheta na Fasoranti rituburu n'ọkwa dịka onyeisi Afenifere n'ihi nka, ma hafee ọchịchị n'aka Adebanjo. Nkwupụta a na-eso njem nleta nke Tinubu gara n'ụlọ Fasoranti, ebe okenye Yoroba ahụ nọ kpeere ya ekpere banyere ọkwa onyeisiala Naịjirịa ọ na-azọ. Kemgbe Tinubu gara njem nleta ahụ, nke ọtụtụ ndị welitere isi n' Ọdịda Anyanwụ gụnyere ndị ndu si Oyo, Ogun, Ondo, Osun, Legos, Kogi, Ekiti, na Kwara, otu Afenifere na-akpọ gharaghara; onye kwuo nke a, ibe ya ekwuo ọzọ. Odeakwụkwọ nchịkọta otu Afenifere bụ Abagun Kole Omololu, kwuru n'ozi o wepụtara na ""ọchịchị Tinubu ga-eweta olileanya, udo, nchekwa, ịdịnotu nakwa ọrụ nye ọtụtụ ndị mmadụ."" Cheta na Adebanjo nọrọ n'ọnwa Septemba afọ 2022 kwụpụta hohaa na otu ha na-akwado Peter Obi nke Labour Party n'ihi na o si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ ebe o kwuru na ọ bụ ha kwesịrị iwepụta onyeisiala Naijiria na 2023. Pa Fasoranti gwara ụlọntaakụkọ Impact TV na ""Abụ m onye ndu otu Afenifere, enwere m ikike ikwado Tinubu."" Ọ gọkwara agụgọ na ya gbara arụkwaghị dịka onyeisi otu ahụ, ma kwukwaa na ""etu e siri nabata Tinubu n'Akure gosiri na ndị mmadụ hụrụ ya n'anya."" Na mkparịtaụka Adebanjo na BBC Igbo nweburu, o kwuru na ebe ya kwụ n'okwu 2023 bụ na ndị oke ahụ ruru bụ ndị Ọwụwa Anyanwụ. O kwuru na ya gbadoro ụkwụ na ikpenkwụmọtọ nakwa e mee nwata ka e mere ibe ya. Pa Ayo Adebanjo kwuru sị, ""A gaghị enwelata udo rue oge rue oge oke ndị Ọwụwa Anyanwu ga-eru ha."" Adebanjo kwupụtara nkwado ya na otu Afenifere nye Obi na-agbanyeghị na Tinubu bụ ọnye na-azọ ọkwa onyeisiala na n'otu ntuliaka ahụ n'aha APC bụ onye mpaghara nke ya. Na nkata ọzọ ya na BBC Igbo nwere, Adebanjo kwuru na, ""O nweghi esemokwu ọbụla mụ na Tinubu nwere, onye m mere Gọvanọ Legọs Steeti""." https://www.bbc.com/igbo/articles/ck7ep72z73eo +sports Arsenal vs Man City: Man City achụghachịla Arsenal na 'lockdown' Goolu Raheem Sterling nyerela Man City zuru iji kpọpee ọnụ ụzọ ka mmiri zobata. Goolu a e nyere na nkeji 45 n'ọkara nke mbụ, mere ya mbụ a na-enye n'asọmpi Premier League dịka a na-amalite ya bụ asọmpi ka ụbọchị 100 e ji kwụsịtụ ya n'ihi mkpamkpa coronavirus gachara. Kevin de Bruyne ji penariti nye goolu nke abụọ na nkeji 51, dịka David Luiz - e webatara nwa obere oge tupu ọkara nke mbụ agwụ - ji aka dọtuo Riyadh Mahrez. A chụpụrụ Luiz n'agbanyeghi na ndị otu ya na-aba mba na-aba mba na-asị na enweghi ihe o mere. Na nkeji 90 na ụma a ga-eji egbuchi bọọlụ, Phil Foden nke Man City emezuo ya atọ site na bọọlụ Sergio Aguero chọrọ mma, iji tinye Arsenal na ndị na-akwado ha n'obi mgbu. Mara na Man City mechara fọ naanị mmadụ 10 n'ọgbọegwuregwu oge Eric Garcia pụrụ, nke a mere n'ihi na ha agbanwechaala mmadụ ole ha nwere ike. A tụkwasịkwuru nkeji 12 n'elu nkeji 90 e ji gbaa bọọlụ a n'ihi ọtụtụ mmerụ ahụ na oge e gburu n'ịṅụ mmiri n'ihi mkpomọkụ dị ebe ahụ. Arsenal gara njem n'ọgbọegwuregwu Etihad bụ be ndị Manchester City, ebe ha gbara egwu onye ike ga-agwụ, mana Man City tiri ha mmọnwụ. N'ime nkeji 25 e ji bido bọọlụ, mmadụ abụọ na-agbara Arsenal - Granit Xhaka na Pablo Mari Villar - pụkwara site na mmerụ ahụ. Ọ bụrụ na Arsenal meriri Man City, Liverpool ji pọịntị 25 aga City, gaara emeri ma bụrụ ndị butere iko Premier League nke afọ 2020 a. Mana oge ka dị. Ka ọ dị ugbua, Arsenal ga-ezute Brighton n'egwuregwu ọzọ ha ga-agba. https://www.bbc.com/igbo/afirika-53072719 +sports EPL Results: Etu okwe si gbaa na 'Premier League' taa Otu egwu bọọlụ dị icheiche a ma aha ha zutere onwe ha n'egwuregwu 'English Premier League' na mgbede Sọnde. Mana ọbụ ndị Arsenal ka obi kacha gbawaa n'ihi ihe igwe 'Video Assisted Refree' (VAR) mere ha. Arsenal na ndị Crystal Palace nyere onwe ha ọkpụ goolu abụọ abụọ. Mana 'VAR' gụpụrụ goolu nke atọ Arsenal nyere. Mana odochaghị anya ihe kpatara e ji gụpụ goolu ahụ. Ọbụkwa 'VAR' nyere penariti ndị Crystal Palace ji nye goolu mbụ ha Liverpool ji bọọlụ gbarie ndị Tottenham, mana goolu ekweghụ ha nnyete. Ha mechara were o jisi ike merie ya bụ asọmpị site n'inye goolu abụọ a satara otu. Jordan Henderson na Mohammed Salah bụ ndị nyeere Liverpool goolu ebe Harry Kane nyere nke ndị Tottenham. Ekwensu ndị Man Utd chọrọ ịbụ ha ọnụ taa mana ha mechara lafere. Ọkpụ goolu atọ asatara otu ka ha ji merie ndị Norwich. Ndị nyere goolu ahụ bụ McTominay, Marcus Rashford na Anthony Martial. Mana goolu ha gaara eru ise. Rashford na Martial tara penariti abụọ na asọmpi ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50202767 +sports Super Eagles Jersey: Gịnị jikọrọ uwe e ji agba bọọlụ na mmeri bọọlụ? Okwu esila n'ihe ọ bụ banye ihe ọzọ dịka ndị mmadụ na-ekwu ihe ha chere mere ka ndị otu 'Super Eagles' ji rie bọọlụ ha na Algeria gbara ụnyahụ. Ebe ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ maka na otu egwurewgu bọọlụ Algeria ka sie ike, ụfọdụ na-ebo ya uwe ndị 'Super Eagles' ji gbaa bọọlụ ahụ. Ọtụtụ n'ime ha na-ekwu na mgbe ọ bụla ndị 'Super Eagles' yi uwe bọọlụ na-acha akwụkwọ ndụ, akwụkwọ ndụ(green), ha ga-adarịrị. @OsasWrite kwuru ka amachie ya bụ uwe bọọlụ 'Super Eagles. @AlfFortune kwuru na a bụrụ ya bu uwe ọnụ. Mana ndị dịka ‏ @EuginhoCortez ekweteghị na ọ bụ uwe nwereike ime mmadụ ọ daa n'asọmpị. @samCodeNg kwuru na ụta adịghịri uwe a eji agba bọolụ mana ọ chọrọ ka akpọ ya ọkụ. Mana o nwekwala mgbe Naịjirịa yi uwe 'akwụkwọ ụgụ' merie? Naịjirịa yi ya bụ uwe merie Libya site n'inye ha ọkpụ goolu atọ asatara abụọ n'asọmpị ntozu AFCON nke 2019. Ha yikwa ya bụ uwe merie ndị otu egwu bọọlụ Egypt site n'inye ha otu gọọlụ asataghị asata n'asọmpị enyi na enyi ha gbara maka AFCON 2019 Lekwa ụfọdụ mgbe ha yi ya wee daa asọmpị Ha yi uwe 'green' a mgbe Madagascar piara ha ọkpụ goolu otu asataghị asata n'AFCON 2019. N'afọ 2018, Argentina meriri Naịjirịa n'asọmpị iko mbaụwa ebe Croatia chụpụrụ ha ajọ mmụọ n'asọmpị ahụ dịka ha yi uwe ahụ. South Africa piara ha ọkpụ goolu abụọ asataghị otu mgbe ha yi uwe 'green' a zute ha n'asọmpị ntozu nke AFCON 2017. Ọ dịkwazi ka mgbe ha yi uwe a wee daa egwuregwu ha karịrị mgbe ha ji ya wee nwe mmeri. Anyị ga-ajụta onye ọnụ na-eru n'okwu ka ha kọwara anyị. Akụkọ na-abia. Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-48979750 +business N1.59trn FG Loan: Gọọmenti ga-ebitezi ya n’ụlọ "Gọọmenti etiti Naịjirịa ebugharịala ọnọdụ na ya bụ ego mgbazite ha chọrọ ibitebụ ndị mbaụwa maka iji mezuo ego ha chọrọ itinye n'ọrụ n'afo 2020. Gọọmenti Naịjirịa tinyeburu ego dị ijeri narị naịra asatọ na iri ise (N850 trn) dịka ego ha ga-agbazite ndị mba ofesi ebe ha ga-agbazite ijeri narị Naira asaa na iri itoolu na anọ n'ụlọ maka imezu ego ha chọrọ iji rụọ ọrụ n'afọ 2020 a. Na mkpụrụ ụbọchị ise nke ọnwa Disemba 2019 ka ndị ọmeiwu Naịjirịa tinyere aka n'akwụkwọ maka ego dị ijeri Naịra iri na ụma (N10.59trn) bụ nke ha chọrọ itinye n'ọrụ n'afọ 2020. Ego a ji ihe dịka pasenti 1.52 gbaa mpe; atụgharịa ya na ego ọbụrụ otu ijeri naịra na ụma iri ise na abụọ (N1.52 trn) bụ nke ha chọrọ ibite na mba ofesi iji mezuo ọgụ. Ụlọọrụ Debt Management Office (DMO) sị na ụgbụa, na o nweghịzị nke ha ga-agbazite n'ofesi. N'okwu ha n'ụbọchị Wenezde, DMO sị na, ""echiche a bụ maka ka ihe siri dowe ihu n'ụwa ugbua maka agha Covid 19 a bụ ozuru mba ọnụ"". Onye ọkachamara n'okwu akụnaụba bụ Uche Uwaleke gwara anyị na ihe dị iche dị. Uwaleke sị na ihe mere o ji dị mma ibite ya bụ ego n'ụlọ bụ maka dọla iri elu karịa ka ọ dị ugbua. Ọ kọwara na ọ bụrụ na dọla rịa, na ọ ga afụ ụfụ n'ahụ ịkwụ ya bụ ụgwọ maka na ego ọmụrụnwa ya ga-arịkwa. Mana agbanyeghị, dịka okwuru, ibite ego na mba ofesi na-aka ọnụ ala karịa ibite ya n'ụlọ maka na ego ọmụrụ nwa nke mba ofesi na-aka ọnụ ala. Ọ sịkwa na ihe dịka ụlọọrụ 'International Monetary Funds (IMF) na-enye ihe dị ka afọ atọ tupu amalite ekwu ụgwọ e bitere ha ma kwụchaa ya n'afo ise ebitere ya bụ ego. Ọ sịkwa n' uru ọzọ dịkwa n'ibete ego na mba ofesi bụ na 'ọ ga-enyere gọọmenti aka ịkwalite dọla aga eji azụ ahịa nke ga-eme na ụkọ dọla agaghị adị, ọkachasị ugbua ahịa mmanụ agbidi danyụrụ anya. Mmanụ agbidi na-ada dọla iri abụọ. Nke a pụtara na ọ bere ihe na dọla iri atọ e ji mee bọjeti. Uwaleke sị na ọ ga-emetuta ndị mmadụ n'ụzọ adịghị mma ma ọ bụrụ na gọọmenti etinyeghị ya bụ ego mbite n'ụzọ ọ ga-amịtara obodo ezi mkpụrụ dịka iji ya rụọ ụzọ, ọkụ, ụlọọgwụ na ndị ọzọ. Ọ si na gọọmenti tinye ego ndị a iji emezie ụmụ ihe ndị a eji enyere ndụ aka, na ụfụ ya bụ ego agaghị adị nke ukwu. Cheta na ego a na-ere mmanụ agbidi, bụ ihe Naịjirịa jiri hiwe isi malitere ịnyụ ka ọkụ kemgbe coronavirus bịara ụwa mgba nke bụ na ego e ji azụ ya bụ mmanụ erụghịzị isiego e ji arụpụta ya. Anyị lebakwara anya n'ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ya bụ ahịa mmanụ agbidi nyụọ ka ọkụ kpam kpam. Olee otu ọnụahịa mmanụ agbidi mbaụwa ga-esi metụta Naịjirịa? Ihe ahụbeghị mere n'ahịa mmanụ agbịdị n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Epreelu dịka udu mmanụ agbịdị nke mba Amerịka rere tọrọ. Ya bụ na n'Epreelu 20, 2020, ego mmanụ agbịdị dara ruo tọrọ -$00:35. Nke a pụtara na ihe mba Amerịka kwadoro ịre mmanụ agbidi ha kpọrọ West Texas Intermediate (WTI) n'ọnwa Mee ji ihe karịrị pasenti narị atọ (305%) sepụ ego n'ihe a na-ere ya. Ndị ọkachamara n'ahịa mmanụ agbidi sị na ihe na-eme n'ahịa ha emenụbeghị n'ụwa. Cheta Nwanze, onyeisi na SBM Intelligence, bụ ụlọọrụ na-eme nnyocha dị icheiche, kwuru na ""Ọ bụ ahụghị ebe a ga-anwụnye mmanụ amịpụtara butere ọdịda nke a."" Ọnụọgụgụ ndị ụlọ ọrụ Dow Jones sị na ụdị ihe ahụ emetubeghị kemgbe amalitere idetụ usoro azụmahịa mmanụ agbidi kemgbe 1983. Agbanyeghị na ndị otu OPEC + buturu mmanụ ha na-ebuputa na mbaụwa, ihe na-ebe ka na-ebe. Ndị International Energy Administration na-eche na mmanụ agbidi ha ga-ere n'ọnwa Epreelu ga-eji ihe karịrị udu mmanụ ruru nde iri abụọ na itoolu daruo ala maka agha Covid-19. Ya bụ agha mere na ndị mmadụ anaghị agagharị nke mere na azụmahịa na mmekọrịta mmadụ na ibe ya kpụrụ afọ n'ala n'ụwa gbaa gburugburu ugbua. Ya mere ahịa mmanụ na ihe niile si na ya ji daa pịị. Ya bụ ọnwụ na-egbu nwankita abụghị taa ka ọ malitere. O bidororii tupu Saụdị Arabịa na Rọshịa amalite agha mmanụa gbidi ha nụrụ n'ọnwa Maachi nke mere ha jiri jụ iso OPEC butuo mmanụ ha na-eresị mbaụwa. Nke a mere ka mmanụ agbidi gbọọ kasaa n'ahịa, mere ndị mba bụ ọkaibe n'ahịa mmanụ agbidi ji kwekọrịta ịwetulata aka na mmanụ ha na-ebupu na mbaụwa. Mana nke a akwụsịghị ihe ọbụla. Ihe na-ebe ka na-ebe. Onye ọkachamara na-azụmahịa na ịchụnta ego bụ Christain Ezeagu kwuru na-egwu ga-adị ma Naịjirịa ereghị mmanụ agbidi. ""Anyị ga-enwe nsogbu ma Naịjirịa ereghị mmanụ agbidi maka na ọ bụ ebe ahụ ka anyị si enweta ego niile anyị nwere"". Ọ sị na Naịjirịa enweghị ụzọ ọzọ ha si akpata ego, ya mere ya bụ ajụjụ ji buru ajọ echiche nye Naịjirịa ugbua. Ọ sịkwa, ""Ndị na-azụ ahịa nkịtị agaghị ahụ ndị ga-ego ha ihe. Ohi na mpụ dị iche iche ga-amụbanwanye n'ododo"". Patrick O. Okigbo nke atọ bụkwa onye aka ya dị na mmanụ agbịdị sị na oge Naịjirịa na-akpanwu ego ha ji ahazi bọọjetị ha ọnaghị arụpụtanwu ihe mmepe obodo. ""Ugbua ọ gaghị enwetenwu ego ọ ga-eji bulie bọọjetị ya, ị na-eche na o nwereike ịrụpụtanwu ihe mmepe obodo?"" Maazị Okigbo jụrụ. Ezeagu n'onwe ya gara n'ihu sị n'ọnwa abụọ gara aga, Naịjirịa na-eretezu Dọla dị ijeri narị naịra mgbe ha na ere otụ udu mmanụagbidi dọla iri ise maọbụ karịa. Mana ugbua, ego otu udu adarụọla anya rụọ dọla iri abụo na ise ebe ha jị dọla iri atọ mee bọjet ha. Ọ sị na e nwere olile anya na ihe ga-adị mma, mana ọ dịrị otua gawa, mara na-egwu ga-adị n'obodo. Odogwu ọzọ n'arukwa n'uloọrụ na-emepụta mmanụ agbidi na-achọghị ka akpọọ aha ya si; ""ọbụrụ na Naịjirịa ereghị mmanụ agbidi, Naịjirịa na ọtụtụ ụlọọrụ agaghị akwụlị ego ha bitere nke ga-ebute ịchụ ọtụtụ mmadụ n'ọrụ."" Maazị Nwanze tụrụ anya na amakaọjọ, atụru anya na ọnụahịa nwere ike ịgbagolite ruo dọla iri abụọ na abụọ n'onwa Juun. Ọ sị na ihe kpara ọdịda n'uche ya bụ na ndi mmadụ ji egwu azụ ya bụ ahịa. ""Ka a na-amalite iche maka WTI n'ụbọchị Tuzde, ego a ga-alịkwa,"" bu okwu Nwanze bịara na mezu n'ụtụtụ Tuzde dịka erere ya bụ mmanụ $13. Maka Naịjirịa, Nwanze si na ihe mere nwanza jiri ebe n'ọhịa ka nọkwa ebe ọ nọ. ""Usoro anyị si akpata ego anwụọla. Nke a pụtara na anyị kwesiri ihazigharị etu anyị ga-esi na-akpata ego maka emeghị nke a ga-ebute ezigbote nsogbu tupu afọ ise agacha."" Okwu a bụ nke ndị ọkachamara ndị ọzọ gbadoro ụkwụ na ya makana na anụ nwere otu mpụ na-anwụkarị ọsọsọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52363418 +entertainment Chinyere Udoma: Ihe ndị ị maghị maka otiegwu ụka "Akụkọ maka otiegwu ụka a ma ama bụ Chinyere Udoma wuru na soshal Midia ụbọchị Tọzde, (18/3/2021) dịka akụkọ fegharịrị na soshal midia na ọ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ n'ọkporoụzọ sị Ọnịcha gawa Owere. Mana Udoma gwara BBC Igbo na mkparịtaụka na akụkọ ahụ bụ okpotokpo asị. ""Ndị Chineke mụrụ dịka o siri mụọ m anaghị anwụ n'ihe mberede nke Okporoụzọ. Nwa Ikuku ka m bụ."" Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ ọ gwara anyị maka onwe ya: Chinyere Udoma bụ onye Nnokwa n'Anambara steeti ma a na-alụ ya n'Alọ, dịkwa n'Anambara steeti. Nnokwa na Alọ bụ obodo gbara agbata obi. ""Ụkwụ m ka na-eji esi be di m eje be nna m."" ""Ije ozi bụ oku a kpọrọ m na nwata mgbe m dị afọ iteghete(9)."" ""E bidoro n'ụlọakwụkwọ nakwa n'ụlọụka."" ""Etoghị m na Naijiria. Ebigara m na mba ụfọdụ dị n'Afrịka dịka Zimbabwe, Kenya na Togo."" ""Ṅwanne Nna m bụ onye na-anọchite na Naijiria na mba ndị a. A tụga ya mba, ana m eso ya aga n'ihi na oge ahụ ọ ka luchara nwaanyị ọhụrụ, o nwebeghị nwa, ebe ọkwa ya bụ ọkwa a na-enye onye nwere ezinụlọ ya, ya mere m si soro ya gaawa oge ahụ."" ""Ọ bụ na ụlọụka St Mary's Catholic Church, Nnokwa, ka m nọrọ chawa, pụta ihe."" ""Ị dịghị ajọ njọ"" bụ egwu butara m n'afọ 1999. Ọ bụ ndị Klints Nigeria Ltd bụ ndị Chukwu ji kwara ngwa ọrụ itipụta egwu ahụ."" Nke so ya bụ, ""I have a Father that will not fail me"" n'afọ 1999. N'afọ 2000, e tipụtara ""Agụ na-eche mba"". ""Mgbe ahụ soshal midia adịbeghị mgbe ahụ."" Egwu ndị ọzọ ọ gụrụ gụnyere ""Ọ nọ n'oche eze ya"", ""Come na see what the Lord has done for me"", ""Adim Well Loaded."", ""Egwu ya nile na-enye ya ọṅụ."" ""Egwu na-esi na mụọ m abịa mana nke m na-agụ ma m chọọ ịkpalite mụọ m elu n'ebe Chineke nọ bụ ""Ị bụ Olileanya m"" ""Mụ na Ifeanyị hụrụ na 'crusade'. Mụ na ya nọ n'oche na 'crusade'."" ""Agụwaala m egwu oge ahụ mana agụbeghị m nke a na-ere n'ahịa."" ""Ha kpọrọ ka m bia kụọ egwu n' ụlọụka ha."" ""Mgbe a kpọrọ m pụta bịa gụọ egwu, ọ jụrụ: ""Ọ bụ gịnwa ga-agụ egwụ, ị maa agụ?"" ""Ọga, m gụọ, ị mara na m ama agụ."" ""Ya na onwe ya bụ nwoke zuru ezu, mụ nwa bụrụ obere ọkara agbọghọ ka bidoro ebido na-eto, ya na-ele m anya okenye na-ele nwata."" Ọ bụ n'ebe ahụ ka ha bidoro kpawa nkata ghọrọ ngịga. Chineke jikwara ụmụ anọ; nwoke atọ na otu nwaanyị gọzie ha. Udoma kọwara na di ya na-enye ya nkwado pụrụ iche n'ọrụ ya, na ọ naghị ege akụkọ ọjọọ ọbụla banyere ya. ""Wepụgodi anya n'ego, buru ụzọ chọwa uto."" ""Sonyesie ike n'ịgara Chukwu ozi n'ụlọụka gị."" ""Ihe niile na-eme bụ ihe gbasaara egwu. E nwere ọba ntipụta egwu."" Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:" https://www.bbc.com/igbo/56449702 +business Enugu Water: Gọọmenti Enugwu steeti ahọpọpụtala Martins Okwor dịka onyeisi ọhụrụ ngalaba mmiri "Aka na achị steeti Enugu bụ Ifeanyị Ugwuamyi ahọpụtala Onyeka Martins Okwor dika onyesisoche ọhụrụ nke ụloorọ na ahụ maka mmiri. Nhọpụta a mere taa bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Maachị. Odeeakwụkwọ gọọmenti Enugu bụ Ọkammụta Simon Uchenna Ortuanya kwuru na nwaamadia bụ onye Ikem dị na okpuruọchịchị IsiUzo dị na steetiu ahụ. O kwukwara na ọ rụọla ọrụ n'ihe gbasara mmiri gafee afọ iri atọ. Cheta na ndị Enugwu bere akwa mmiri kemgbe abalị olenaole gara aga dịka ụkọ mmiri na-anyụ ha anya ebe ahụ. Ndị bi ebe ahụ sị na o ruola nke bụ na nri dị mana mmiri eji esi ya adịghị. Otu onye BBC gbara ajụjụ ọnụ sị na, ""O meela ụbọchị olenaole anyị ji ata ezigbo ahụhụ maka ụkọ mmiri n'Engugwu"". Gọọmeti Enugu steeti ekwuola na ha na-arụgharị ọwa mmiri pọmp n'Enugwu na ọ bụ ya butere ya bụ ụkọ mmiri. Kọmishọna na ahụ maka mmiri na steeti bụ Dubem Onyia Jr ahụ sị na ọ ga-erucha Ọgọst 2021 tupu o bie." https://www.bbc.com/igbo/56245386 +politics Onye ndị uweojii na-eche wakporo ụlọọrụ Inec n'Ọlụ, Imo Steeti "Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ndị echere bụ ndị otu amachịrị amachị bụ Indigenous People of Bioafra nke bụ Ipob n'ịchafụ na aka ike otu a bụ Eastern Security Network(ESN) wakporo ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka nke bụ Inec n'ịchafụ n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Sepụtemba n'ihe dịka elekere anọ nke ụtụtụ. Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Michael Abattam depụtara nke a n'akwụkwọ ozi ha zipụrụ ma sị na ndị a bịara n'igwe ha ma tụọ ogbunigwe arụrụ n'ụlọ n'ime ogige ụlọọrụ ahụ. O kwuru sị, "" Ha bịara n'igwe ha, na-atụ ogbunigwe ma na-agba egbe. Kama ndị uweojii ekweghị ha mezuo uche obi ha"". O kwuru na ndị uweojii nọ n'ogige ahụ gbasoro ndị omekome a egbe nke mere na ọtụtụ n'ime ha bu mgbọ n'ahụ gbafuo. Abattam kwuru na enweghị onye nwụrụ ma sịkwa na enweghị ngwa ọgụ ọbụkla ndị ahụ nwereike ịnweta. O sị, "" Ya bụ ogbunigwe ha tụrụ emetụtaghị ụlọ Inec kama na ọ bụ ọbere ụlọ ndị nmchekwa ka ha bụ ogbunigwe metụtara ọbere. Ọ kọwara na ha ebidola nyocha ha ma sị na ọcheghị na ndị omekome a gatere aka n'ihi etu ọbara siri ụsasịa n'ala mgbe ndị omekome a na-agba ọsọ. N'aka nke ọzọ ka Kọmịshọna ndị uweoji steeti ahụ bụ Mohammed Ahmed Barde toro ndị uweojii etu ha siri gbochie ebum n'ụche ndị omekome a ma gbaa ha ume ka ha jisie ike hụ na-ejidere ndị omekome niile n'Imo steeti ma kpee ha ikpe etu ọ kwesịrị. Ngalaba na-ahazi ntụliaka na Naịjirịa bụ INEC n’ịchafụ ekwuola na ndị omekome awakpola ma gbaa ụlọorụ ha dị n’Orlu ọkụ. Ha kwuru na ndị omekome ahụ tọọrọ ndị na-arụgharị ụlọ atọ n’ime mmadụ asaa ma mechaa tọghapụ ha. Kọmịshọna Inec n'Imo steeti bụ Sylvia Agu kwuru na ụlọ nke a gbara ọkụ bụ nke ndị omekome wakpoburu n'oge gara aga a na-arụgharị. O kwukwara na mwakpo ahụ kaara ị ka njọ karịa etu ọ dị ma ewezuga ndị uweojii gbataara ha ọsọ enyemaka ozugbo ozugbo. Nke a ga-eme ya ugboro anọ n'izuụka anọ a ga-awakpo ụlọọrụ Inec dị na steeti dị icheiche dịka awakpoburu Ogun, Osun nakwa Ebonyi steeti." https://www.bbc.com/igbo/articles/cx0748ddn5qo +health Overcoming depression: ‘Ịzụ ụmụanụmanụ dọpụtara m n’echiche ịkwụ ụdọ’ Iyke Elueze nwa afọ Igbo ndụ na-atọ ka nnu. Ọ na-ama akwụkwọ ma bụrụkwa onye a ma ama n'ụlọakwụkwọ. Mana egwu dagharịrị ka ọ banyere mahadum. Nsogbu dị iche iche dakwasịrị ya nke mere o jiri gaa mahadum anọ tupu o nwee ike ịgụcha akwụkwọ mahadum. Nsogbu emeghị ihe mgbe ọgbọ ya mere, butere ya oke echiche na obi nkoropu nke bụ na echiche igbu onwe ya banyere ya n'ime. N'ihe onyonyo a, Iyke onye nwere nkịta iri, icheoku atọ nakwa otu nwamba, kọwaara BBC etu ịzụ amụmanụ si dọpụta ya n'echiche ikwụgbu onwe ya. Lee akụkọ ije ya n'ihe nkiri a: https://www.bbc.com/igbo/48203757 +health Gingivitis, periodontitis na ọrịa ndị ọzọ ga-etinyenwu ọnụ gị na nsogbu "E nwere ike a jụọ gị ọrịa ndị ị ma na-enye nsogbu n'ọnụ mmadụ i kwuo; ọnụ isi, eze ure nakwa eze mgbu, mana ị ma na ọrịa eze nwere ike igbu gị? Ndị ọkachamara n'ihe gbasara eze, ọrịa na-eso eze na nlekọta ya, na-akọwa na ọ bụghị naanị ihicha eze gị n'ụtụtụ ga-egbochi ụfọdụ ọrịa na-eme n'eze mmadụ. Dọkịta na-ahụ maka eze gwara BBC Igbo na ụfọdụ mmadụ esila n'ọrịa eze laa mmụọ, mana anyị ga-akọwara gị etu nke a si eme. Ị na-ata atụ n'ụtụtụ mana ọ bụ naanị ebe ahụ ka ihe gbasara idebe ọnụ gị ọcha biri? Dkt Olakunle Ogunbayo bụ dọkịta eze kwuru sị na o bighi naanị n'ịta atụ n'ụtụtụ; ihe ndị ị na-etinye n'ọnụ gị na-eso eme ka ị mara ma eze ọ ga-ere gị maọbụ ọ gaghị ere gị. Ọ gara n'ihu kpọpụta ọrịa ndị nwereike imekpa eze gị ahụ nakwa etu ị ga-ezi echekwa eze gị. Lee ọrịa ndị ahụ nwereike ịkpa mkpamkpa n'ime ọnụ gị, ọkachasị n'eze gị: 1) Eze kpọpuru akpọpu/eze ure (Cavities/dental caries): Ị ma ihe ahụ na-acha ọcha na-adị n'eze gị tupu ị saa ọnụ n'ụtụtụ? Ọ bụkwa ya bụ ""plaque"" a na-ekwu okwu ya. Mana mgbe ọ na-abụ nsogbu bụ mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-anaghị asa eze ha hapụrụ ya ka ọ tọkịrị n'eze ha, kpọọ nkụ ebe ahụ dịka foto a na-egosi n'ala. Eze mkpọpu na-esikarị n'ebe nke a kpọrọ ""plaque"" bụ ihe ahụ na-acha ọcha na-anyado n'eze na-amụkọ n'eze onye anaghị ata atụ ọfụma, nri fanyere n'eze, asọmmiri nakwa nje bakteria. Bakteria a na-amụpụta asidi dịka ọ na-erikwa nri ị na-etinye n'ọnụ. Nke a na-eme ka eze gharazie isi ike etu o kwesịrị. Nke a na-emekwa ka ya bụ bakteria na-abanye n'ime ime eze, mee ka okpuru eze ebe a na-akpọ ""pulp"" na Bekee ghere oghe. Eze ghere oghe butezie ọrịa, eze ahụ anwụọ. Ihe ọzọ na-ebute mkpọpu eze a nke na-ebutekwa eze mgbu bụ ịṅụfe mmanya maọbụ nri ndị nwere shuga oke. Mana ị ga-egbochinwu eze gị inwe mkpọpu ma ọ bụrụ na ị na-asa eze gị kwa mgbe kwa mgbe n'ihi na ọ ga-ewepụ ""plaque"" a na-amụkọ n'eze, nakwa site n'igakwuru ndị dọkịta eze bụ ndị ga-ewepụnwu plaque ahụ. ""Ludwig's Angina"" bụ ọrịa eze nwereike ibute ọnwụ gị ma ị na-akpachaghị anya. Ọrịa a bụ ọrịa na-eme n'ala ọnụ mmadụ, n'okpuru ire nke nwereike ibute ihe a kpọrọ ""tooth abscess"" bụ mgbe abụ banyere n'ime eze mmadụ. O nwekwara ike ịbanye n'ime akụkụ ọnụ ndị ọzọ ọkachasị ma mmadụ nwee ọnya n'ọnụ. Ihe ndị ọzọ na-egosi na mmadụ nwere nsogbu a gụnyere ọzịza ire, olu mgbu na ntị mgbu, ilo ihe nakwa ikwu okwu nwereike ịra ahụ, nakwa mgbe iku ume rawara ahụ ụfọdụ oge. Ọzọ bụkwa na ọ na-ebute ahụ ọkụ, mgbagwoju anya nakwa ike ọgwụgwụ. Gịnị na-ebute ọrịa a? Elekọtaghị eze gị ọfụma, ọnya n'ime ọnụ nakwa ụfọdụ oge ọ bụrụ na efopughi gị eze ọfụma. Gbara gakwuru dọkịta eze ma dịrị ihe a mewe gị, makana o nwereike ibute ọnwụ. 3) Ọzịza ukwu eze (Gingivitis): Ọrịa a na-emekarị ndị okenye karịa ụmụaka. Ọ na-abịa mgbe bakteria na-eri n'ọnụ mmadụ mụkọrọ n'ukwu eze mmadụ, nke na-eme ka plaque (nke a na-akpọkwa ""tartar"" maọbụ ""calculus"") ahụ na-amụkọ n'eze mmadụ sie ike. Nke a na-amụkọ ma na-agbasa oghere dị n'etiti eze, ma bute ọzịza ukwu eze. Ụfọdụ ọgwụ mmadụ na-aṅụ nwekwara ike ibute ọrịa eze a. Ihe ndị na-egosikarị na mmadụ nwere nsogbu a karịa na ukwu eze onye ahụ zara aza gụnyere na ukwu eze ahụ ga na-agba ọbara ma ọ na-echi eze ya, o nwereike inwe eze mgbu, ọnụ ya ga na-esikwa isi. Ọ bụkwa ọzịza ukwu eze a na-agwọghị agwọ na-ebu ụzọ egosi na mmadụ enweela nsogbu a kpọrọ ""periodontitis"", nke nwereike ibute mmebisi ihe ndị na-ejide eze mmadụ nakwa mee ka eze na-adapụsị. Ukwu eze gị na-aza aza gbaa mbọ gakwuru ndị dọkịta eze ka ha lee ya anya. Dkt Ogunbayo kwuru na e nwereike isi n'eze mmadụ mara ma o nwere ụfọdụ ọrịa gụnyere ọrịa shuga (diabetes) nakwa nkwụsị ịhụ nsọ na nwaanyị (menopause). 4) Periodontitis: Ọrịa a na-esi na ọzịza ukwu eze a na-agwọghị agwọ malite, nke bụ na elekọtaghị eze ọfụma na-ebute ọrịa a. Bakteria na-ebute ozịza ukwu eze, na-ebute periodontitis a bụ mgbe uru anụ na ọkpụkpụ na-ejide eze malitere iri mperi. Periodontitis na-akpa mkpamkpa, ọ na-eme ka oghere dịchaa n'etiti eze nakwa n'ukwu eze dịka foto a dị n'elu. N'afọ 2019 ka ndị ọkammụta sayensị chọpụtakwara na ọrịa a nwereike ibute ọrịa nchefu ihe a na-akpọ ""Alzheimer's"" na Bekee. A na-eche na ọ na-egosikwa na mmadụ nwere ọrịa ogbu na nkwonkwo a na-akpọ ""Arthritis"" na Bekee. 5) Ọnụ isi (halitosis): A ka kwesịrị ịkọwara gị nke a? Ọnụ isi bụ mgbe ajọ isi si mmadụ n'ọnụ na-ekuputa ma o meghee ọnụ. Ụfọdụ oge ọ na-abụ n'ihi elekọtaghị eze nakwa ọnụ ọfụma na-ebute ya, mana ọnọdụ ahụike mmadụ na-ebutekwa ya. Elekọtaghị eze dịka mgbe mmadụ akpachapụghị ihe kpafanyere ya n'eze, bakteria bịazie tinye aka gbarichaa ya, onye ahụ abanye na nsogbu a. Ihe ndị ọzọ na-ebute ya bụ ise anwụrụ, ọnụ asọmmiri kọrọ (dịka mgbe mmadụ anaghị emepụta asọmmiri etu o kwesịrị nakwa ụfọdụ ndị na-eghewe ọnụ oghe arahụ ụra) nakwa ụfọdụ ọgwụ mmadụ na-aṅụ maka ọrịa ndị gụnyere ọbara mgbalieleu nakwa ọrịa mammịrị. Igbochi ya, ị ga na-asacha nakwa na-aghụchasị eze gị ma ị gụrụ gụrụ. Ị ga-agakwurukwa dọkịta eze. 6) Eze iju mmadu n'ọnụ (hyperdontia): Nke a bụ mgbe eze juru mmadụ n'ọnụ, ụfọdụ na-eto ma n'ukwu eze ebe eze ekwesịghị ito. A na-ejikarị ihe nnyocha X-ray achọta ya. Ụfọdụ na-eto n'azụ eze 32 ahụ na-adị onye toro eto n'ọnụ, bụrụzịa ihe a na-akpọ 'eze ịyaramịya'. Ọnọdụ a anaghị afụkarị ụfụ, mana ụfọdụ oge ọ na-eme ka ukwu eze gị zaa aza, nakwa mee ka eze gị ndị nke nọ ọfụma gbagọo agbagọ. Amachaghị ihe na-ebute ya, mana a na-eche na ụfọdụ ọrịa na-esi n'agbụrụ efe mmadụ gụnyere ""Gardner's syndrome"", ""Ehlers-Danlos syndrome"" na ndị ọzọ. Anaghị agwọkarị ya, mana ọ bụrụ na ọ na-enye onye nwe ya nsogbu dịka ma ọ na-ata ihe maọbụ n'ịta atụ, ndị dọkịta na-ewepụ ya. 7) Eze ịkọ mmadụ n'ọnụ (Hypodontia) bụ ndịiche ""hyperdontia"": ""Hypodontia"" b��� mgbeeze karịrị isii bụ nke na-ekwesịghị ịdapụ adịghị n'ọnụ mmadụ. Nke a dịkwa iche na mgbe eze mmadụ ezughi ezu n'ihi na ọ merụrụ ahụ maọbụ na o nwere nsogbu eze. Gịnị na-ebute ya? Ọ na-esikarị n'agbụrụ. Etu e si agwọ ya? Ndị dọkịta eze na-ejikarị ihe ha na-akpọ akwa (dental bridge) ejide eze arụrụ arụ ka ọ ghara ịmịchapụta. Ha na-ejikwa nke a kpọrọ ""dentures"" bụ eze arụrụ arụ, etichi eze ndị ahụ nakwa ""dental implants"" bụ nke yiri ezigbo eze mmadụ a na-esi n'ukwu eze etinye. Ọrịa ndị ọzọ na-enye nsogbu n'ọnụ gụnyere nke a na-akpọ ""Oral psoriasis"" nakwa ""Oral cancer"". Nke a bụ mgbe ọnya na-agbakasị mmadụ n'ọnụ. Ị nwereike isi n'ụzọ ndị a lekọta eze gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-53350578 +business Ethiopian Airlines: India, UK na ndị ọzọ amachiela Boeing 737 Max "Akụkọ dị mkpa Mba Briten na mba Yurop ndị ọzọ amachiela ụgbọelụ 737 max niile ife na mba ha dịka ụgbọelu ahụ kpọkasiri n'ụtụtụ ụbọchịụka. Nke mere ya ugboro abụọ ụdị ụgbọelu a na-akpọkasị n'ime ọnwa ise. Onye merịrị na ntuliaka ọkwa gọvanọ n'Imo steeti bụ Chukwemeka Ihediọha ekwela ndị Imo nkwa na n'oge nke ya, ""ọchịchị obodo ga-anọ n'aka ndị obodo."" Ihedioha kwuru nke n'ụlọ ya n'Owere ụbọchị Tuzde oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu. INEC kpọpụtara Ihedioha dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti emere n'abali itolu nke ọnwa Maachi. Ụdị ọṅụ juru ndị mmadụ obi ka ya bụ ihe mere bụ ihe ụfọdụ ndị atụwaghị anya, makana ọ bụ okwu a kpụ n'ọnụ ma n'ụzọ ma n'elu soshal midia, ruo ugbua. N'aka nke ọzọ, Uche Nwosu nwetara ọnọdụ nke abụọ n'ọsọ ahụ anyaala isi na ọ ga-aga ụlọikpe gbagha mkpebi Inec na ntuliaka ahụ. N'egwuregwu, Aka chịburu Manchester United bụ Louis Van Gaal alaala ezumike nka ka ọ dị afọ iri isii na asaa. Ọ chịkọtara ụfọdụ otu egwu bọọlụ gụnyere Bayern Munich, Ajax, Barcelona na mba Nertherlands. Akụko BBC Igbo na nkeji N'Afrịka Ngagharịiwe ndị mba Ọljiria akwụọla ụgwọ makana onyeisiala chịrịla ha afọ iri abụọ bụ Abdelaziz Bouteflika, ekwetala ịhapụ ọchịchị ọ chọburu ịchị nke ugboro ise. N'otu aka ahụ, Bouteflika dị afọ 82 higharịrị ntuliaka ha kwesịrị ime n'ọnwa Epreelụ. Cheta na ndị mba ya mere ngagharịiwe gafere izu abụọ, ebe ha na-achọ ka ọ rịtuo n'ọkwa ma ghara ịzọ ọchịchị ọzọ dịka ọ chọburu. Emeka dị ọha Imo mma Ndị Imo steeti ekwuola na Emeka bụ Ihe dị ọha mma ka ngalaba INEC kpọpụtara aha Chukwuemeka Ihedioha dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti. Ụdị ọṅụ juru ndị mmadụ obi ka ya bụ ihe mere bụ ihe ụfọdụ ndị atụwaghị anya, makana ọ bụ okwu a kpụ n'ọnụ ma n'ụzọ ma n'elu soshal midia, ruo ugbua. O kwere ndị Imo nkwa na n'oge nke ya ""ọchịchị obodo ga-anọ n'aka ndị obodo."" Emeka Ihedioha kwuru nke n'ụlọ ya n' Owere n'ụtụtụ Tuzde oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu. N'aka nke ọzọ, Uche Nwosu nwetara ọnọdụ nke abụọ n'ọsọ ahụ anyaala isi na ọ ga-aga ụlọikpe gbagha mkpebi Inec na ntualaka ahụ. N'akụkọ yiri ya, INEC agụnyekwuola ntuliaka e mere na Kano n'ime ise ndị ha kwuru na mpụtara ya ezughi ezu igbanwe ntuliaka nke bụ ""inconclusive"" na bekee. N'akụkọ si mba ọzọ, Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na mba US bụ FAA, agwala ndị ụlọorụ njem ụgbọelu na enweghi ihe ha chere na-egbochi ụgbọelu Boeing 737 Max 8 ife n'elu, n'agbanyeghi na ụdịrị ụgbọelu ahụ akpọkasịala ugboro abụọ n'ime ọnwa isii, ma gbuo mmadụ narị atọ na iri anọ na isii. Ka ọ dị ugbua, mba Sịngapọ akwụsịla ụdịrị ụgbọelu Boeing 737 ahụ ifebata maọbụ ifepụ na mba ha, dịka ụfọdụ ndị ụlọọrụ njem ụgbọelu gụnyere Ethiopian Airlines, Cayman Airways nakwa Comair machiri nke ha. N'egwuregwu, Ọ bụ n'aka Zinedine Zidane ka inyeaka ndị Real Madrid ga-esi bịa? Ajụjụ a welitere isi ka Zidane lọghachịtara ịchị Madrid ọzọ n'ime ọnwa iri o ji pụọ, nke bụ na a chụọla Santiago Solari na-achịkọtabu ha, ụkwụ eru ala. Akụkọ dị mkpa n'otu nkeji: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-47535338 +sports Ihe mere owuite ji anyụ ụfọdụ ndị gbabuuru Naịjiria bọọlụ anya "Ụfọdụ ndị ọgbabọọlụ gbabuuru Naịjiria bọọlụ mechara 'daa ogbenye', mere ka ụfọdụ ndị na-ajụ ihe ha ji akụnaụba ha kpatara mee. BBC Igbo zutere mmadụ abụọ gbabuuru Naịjiria bọọlụ, ha kọwara ihe ndị egwu bọọlụ na ego ha kpatara na-aga. Ha kọwaara BBC etu ha na ije si gaa mgbe ha na-agba bọọlụ na etu ọnọdụ dị ha ugbua. Olisa Michael Onuchukwu, otu onye ji agbambọọlụ mere aka ọrụ ma kpaa ego tupu o mechaa wụsa akpụkpọụkwụ ya, gwara BBC Igbo na ihe na-emekarị ndị ọgbabọọlụ mechara banye n'ihe isi ike bụ ahazighi onwe ọfụma. Onuchukwu gbaara FC Wuhan dị na mba China bọọlụ ebe afọ 1996. O kwuru na mgbe ọ gbara bọọlụ, na a na-akwụru ụfọdụ ndị puku dọla iri isii ($60,000) kwa ọnwa, mana ugbua ""a na-ebunye ego nyafun nyafun"". Onuchukwu bụ onye nchịkọta otu egwu bọọlụ Nnewi United, kọwara ihe ndị na-emefu ego onye ọgbabọọlụ. Kingsley Obiekwu gbabuuru Naịjiria bọọlụ dịka onye egwu azụ site n'afọ 1996 tupu ọ wụsa ọwa n'ịgba bọọlụ n'afọ 2004. Obiekwu so n'otu Naịjiria buliri iko nke Olympics nke afọ 1996, mgbe Naịjiria ritere ọlaedo n'asọmpi bọọlụ. Obiekwu bụkwa onye nkuzi bọọlụ ugbua, gwara BBC etu o si gbachaa bọọlụ na mba Holland ebe ọ nọrọ afọ atọ, na etu ego ọ kpatara si laa n'ajọ azụmhịa o mere. O kwukwara etu o si nyawa ọkwọụgbọala e ji eme njem. Obiekwu na Onuchukwu kwuru na ọ bụ ihe ndị a na-ebute ndị gbaburu bọọlụ 'ịda ogbenye': Gee ihe ha kwuru n'uju:" https://www.bbc.com/igbo/articles/cv2880d0w0lo +business MMM: Atụmaatụ a ọ laghachitela? "MMM nke a na-akpọ ""Mavrodi Mundial Moneybox"" na bekee alaghachitela azụ dịka ndị nwe atụmaatụ a si depụta na webụsaiti ha. Atụmaatụ a nke ndị nwe ya kwuru na ndị mmadụ ji enweta enyemaka , ma bụrụkwa nke ụlọakụ gọọmenti dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha gbara ọsọ, kwuru na ha adịla njikere ịmalite ọzọ. N'ọnwa Aprelu nke afọ 2018, ndị nwe ya bụ atụmaatụ gwara ndị mmadụ na ha gbachiri ọnụ ụzọ ha maka onyeisi ha bụ Sergie Mavrodi anwụọla. Ọtụtụ ndị mmadụ si mba Ghana, Kenya nakwa Naijirịa tufuru ọtụtụ ego mgbe aka bidoro gbajiwe atụmaatụ a n'afọ 2016. Nchọpụta BBC mere gosiri na dịka nke mbụ ndị mmadụ ga-edebanye aha na webusaiti MMM, ha ewepụtakwuola akara Whatsapp ndị Naịjirịa ga-eji na-eme ya bụ atụmaatụ. Ha kwuru na ugbua na ọ bụ 'robot' ga na-ahazi etu esi eme MMM kama mmadụ. Gọọmenti Naịjirịa na-adọsi ụmụ Naịjirịa aka na nti ike ka ha gbaara ụdịrị atụmaatụ a ọsọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-48735843 +politics Oyetola, Adeleke, Lasun... Lee ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Osun Steeti Na Satọdee na-abịanụ, bụ abalị iri na isii nke ọnwa Julaị afọ 2021, ka a ga-eme ntuliaka iji họpụta gọvanọ ga-anọ n'ọchịchị maka afọ anọ na-abịanụ. Mmadụ iri na ise bụ ndị na-azọ ọkwa a, nke gụnyere Gboyega Oyetola bụ Gọvanọ nọ n'ọchịchị ugbua. Oyetola na-azọ ọkwa gọvanọ nke ugboro abụọ, mana e nwere ndị isi kara aka so ya azọ ọkwa ahụ. Accord - Akinade Akanmu Ogunbiyi Africa Action Congress - Awojide Peter Segun Action Democratic Party - Kehinde Munirudeen Olumuyiwa A Atanda All Progressives Congress - Adegboyega Isiaka Oyetola Allied Peoples Movement - Awoyemi Oluwatayo Lukuman All Peoples Party - Adebayo Adeolu Elisha Boot Party - Adeleke Adesoji Masilo Aderemi Adedapo Labour Party - Yussuff Sulaimon Lasun New Nigeria Peoples Party - Rasaq Oyelami Saliu National Rescue Movement - Abede Adetona Samuel Peoples Democratic Party - Adeleke Ademola Jackson Nurudeen Peoples Redemption Party - Ayowole Olubusuyi Adedeji Social Democratic Party - Omigbodun Oyegoke Akinrinola Young Peoples Party - Ademola Bayonle Adeseye Zenith Labour Party - Adesuyi John Olufemi Adegboyega Oyetola Ademola Adeleke Yusuf Lasun Akin Ogunbiyi Omigbodun Akinrinola Oyegoke https://www.bbc.com/igbo/articles/cl470lrn2jko +entertainment Ite paụda, ili eriri otubo na omenala ndị ọzọ Ndigbo na-eme n'oge ọmụgwọ "Ọtụtụ omenala Igbo nwere bụ ihe ndị mmadụ ka na-akwadosi ike n'agbanyeghị na ọtụtụ amaghị ihe ha pụtara. Ịma atụ bụ etu mmadụ na-esi ete nzu Bekee a na-akpọ ""powder"" n'ihu maọbụ n'aka ma ọ garuo ebe a mụrụ nwa ọhụrụ, mana ọtụtụ amaghị ihe ya na ya so. Akụkọ a ga-etinye anya n'ụfọdụ omenala ndị a na mpụtara ha. 1: Ite nzu maọbụ 'paụda' Maazị Ozioma Odinani bụ onye ihe omenala Igbo na-adị mma, kọwara na ""powder"" bụ ihe ndị agba ọhụrụ ji mere nzu. N'Igbo gboo, nzu bụ amụma ọcha. Ozioma sị: ""a mụọ nwa ọhụrụ, a na-ahụ ya dịka onwe enweghị njọ, nke mere ndị mmadụ ji ete nzu iji mee ọṅụ nwa. Ihe aka e tere nzu pụtara: Ebe e tere nzu nwekwara ihe ọ pụtara. Ị hụ onye si ebe a na-eme ọṅụ tere nzu n'aka nri ya, o gosiri na ọ bụ nwa nwoke ka o si ọṅụ ya. Ọ bụrụ n'aka ekpe, ị mara na ọ bụ nke nwa nwaanyị. Eriri otubo nwa so n'ihe a na-akwanyere ezigbote ugwu n'ala Igbo. Dịka omenala siri dewe, a na-eli eriri otubo ebe a mụrụ nwa ahụ. Ya bụ, ugbua a na-aga ije, n'usoro omenala, e kwesịrị iwere eriri otubo nwa laa obodo nna ya gaa lie ya. Omenala a abụghị ihe a ka na-emesi ike ugbua, mana ụfọdụ ka na-eme ya. 3: Ili alọ (placenta) Dịka eriri otubo, alọ bụkwa ihe a na-asọpụrụ nke ukwuu n'ala Igbo. Dịka eriri otubo, a na-eli uwo n'ebe nwa a mụrụ ọhụrụ si. Etu o si kwụrụ bụ na a ga-ahọta otu ukwu osisi n'ezinaụlọ nwa ọhụrụ ahụ, ma lie uwo ya n'ukwu osisi ahụ. Mana, ugbua, anaghịzị emekarị ya. Mmadụ niile ma ihe bụ ọmụgwọ, nke bụ mgbe nne nwaanyị maọbụ nne di ya nọnyetụrụ ha iji nyere ha aka. Ọtụtụ mmadụ na-ahụ uru ọmụgwọ bara na etu nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ga-esi nwete enyemaka nakwa nkwado. Ọmụmụ na-esokwa ya, ọkachasị ebe nwaanyị amụbeghị nwa mbụ. 5: Ịgụ nwa aha Ndị Igbo na-eme emume ịgụ aha site n'ụbọchị asaa ruo ụbọchị 12 a mụchara nwa. Ihe a bụ oge a na-egosi obodo nwa ahụ. N'emume a, ezinaụlọ nakwa ndị obodo na ndị enyi ga-ezukọ kpeere nwa ahụ ekpere. Ugbua, ọtụtụ mmadu na-agazị ụka ime emume a ebe ọtụtụ anaghị eche ka oge a ruo tupu ha a gụọ nwa aha. 6: Ibi ugwu Ibi ugwu bụbu ihe a na-eme nwa nwoke nakwa nwa nwaanyị, mana ugbua, ọ bụzị sọsọ nwa nwoke ka a na-ebi ugwu. A na-ebikarị nwa nwoke ugwu ma ọ gafechaa abalị atọ maọbụ karịa, a mụrụ ha. A na-asị na ọ dị mma ibi ugwu ahụ tupu nwata amata na ihe na-afụ ụfụ, dịka a na-eche na ihe anaghị afụ nwa ọhụru ụfụ etu ọ sị afụ nke katarala ahụ. Amachaghị uru ibi ugwu baara ndị Igbo mana a na-ekwu na ọ bụ ihe si n'oge gboo." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53928750 +entertainment Igbo Greetings: Uru ekele bara n'ala Igbo "Ndị Igbo tụrụ ilu sị na, 'Ekele na-eme ka ihu saa' dịka ọ bụ ụzọ mmadụ ji egosipụta etu obi dị ya n'ebe onye ọzọ nọ. N'omenala Igbo, ekele bụ ihe mbụ na-ebute ụzọ na mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ma bụrụkwa ụzọ e ji egosi nkwanye ugwu. Ikele na ikwe ekele bụ ihe zuru ụwa niile ọnụ. Ma ndị isiọcha, ndị isiojii, ndị Awụsa, Yoruba na ndị Igbo na-ekele ekele. Mana akụkọ a na-eleba anya n'ekele dịka omenala na njirimara ndị Igbo. Kedụ etu ndị Igbo si ahụta ekele? Ekele so n'otu n'ime omenala ndị Igbo gbapụtara ihe nke mere na onye Igbo ọbụla na-akpụ ekele n'ọnụ mgbe niile. Ekele n'ala Igbo dịrị nwoke ma nwaanyị, nwata nakwa okenye mana ọ bụ nwata na-ebu ụzọ a tụpụ ekele. Ihe mbụ a na-akụziri nwata n'ala Igbo bụ etu o si ekele ekele karịsịa ndị tọrọ ya atọ na nzaghachị okenye ga e kelekwa ya. N'ala Igbo, e nwere ụdị ekele dị iche iche, nwee oge e ji ekele ha, nakwa ihe nke ọbụla na-egosipụta. Ụfọdụ n'ime ha gụnyere; Ekele njirimara ndị Igbo -Nke a bụ ekele e ji mara ndị Igbo, ha ji enwe mmekọrịta karịsịa ma ha nọkọrọ ọnụ n'ime ọgbakọ dị iche iche. I ji maa atụ bụ Chaa! Chaa!! Chaaa!!! Igbo kwenu! -Heee! Mụọnụ - Heee! Zụọnụ - Heee! Rienu! - Heee! Kachaanụ - Heee! Ekele oge ụbọchị - Ekele oge ụbọchị bụ ndị a na-ekele n'oge dị iche iche n'ụbọchị dịka n'ụtụtụ, n'ehihie nakwa n'abalị. Iji maa atụ, ""Ị bọọla chi?""; ""Ị pụtala ụra?""; ""Ụtụtụ ọma;"" ""Daalụ"" Ehihe ọma, Ụhuruchi ọma, Ị batala ọrụ nke taa? Ka chi fo, Rahụ jụụ dgz. Ekele ọrụ - Nke a bụ ekele ndị a na-ekele mgbe mmadụ na-arụ ọrụ, e nwekwara ike iji ya a gba mmadụ ume nke gụnyere Jisie ike, Ndewoo, Daalụ dgz. Ekele ọrụ na-adịkwa iche site mpaghara Igbo dị iche iche. Ndị mpaghara Enugwu na-ekwu , 'Dejee', ndị Bende n'Abịa steeti na-ekele, ""Jọkwa"", ebe ndị Ngwa na-ekele , ""Maazị"". Ndị Abakaliki na-ekele, ""Tọkwe ehụ"" (well done), ebe ndị Afikpo na-ekele ""Ị dị ike ọrụ,"" maọbụ ""Ka."" Ekele njem - Ekele a bụ nke ndị Igbo na-atụpụrụ onye na-eme njem dịka ""Ije ọma"", ""E jee a lọọ"", ""Ije awele"", ""ka ọ dị"", ""ka okporoụzọ rubere gị isi"" dgz. E nwekwara nke e ji a nabata onye si njem bata dịka ""Ị lọtala?"", ""Nnọọ"" dgz. Ekele nkasi obi - Ọ bụ ekele ndị Igbo ji akasi onye nwere otu ọdachi maọbụ nke ọzọ obi n'ihe dakwasịrị ya dịka ""Kara obi"", ""Diwe"", ""Ndo"", ""Gharawa"" dgz. Ekele nri - Nke gụnyere ekele a na-ekwe mgbe ndị Igbo na-eri nri maọbụ mgbe ha richara nri dịka; ""Bịa rie nri"", I meela, I sie, Daalụ na nri ụtọ a dgz. Ndị Igbo nwekwara ụzọ dị iche iche ha ji egosipụta ekele na-abụghị site n'okwu ọnụ nke gụnyere Ikwekọrịta n'aka, Ife aka, ịkụkọta akupe ( ndị ichie), ibi ọma, itu mmadụ aha na ndị ọzọ. A bịa n'ime usoro ekele niile ndị a, ihe kachasị mkpa bụ iji nghọta, nsọpụrụ nakwa obi ọcha e ji kele ha. N'ihi na ọ bụ nke a ga-akọwa ebumnobi onye mmadụ nwere n'ebe ibe ya nọ n'agbayeghi mgbe ụfọdụ ""ụtọ abụghị n'ọchị eze"". Akụk��� dị ga-amsị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50675411 +business Chef Mohammed: Etu m si malite isi nri ọdịnala ndị Naịjirịa Osite a ma ama bụ Mohammed Baydoun bụ nwafọ mba Lebanon akwaala ihe mere jiri hụụ nri ọdịnala ndị Naịjirịa n'anya bụkwanụ nri ndị na-amasị ya isi. Na mkparịtaụka Mohammed na BBC Igbo nwere, ọ sị na nri Naijiria bụ nri kachasị ụtọ n'ụwa maka na o nwere akụrụngwa ọnatarachi dị icheiche e ji esi ha. Ọ sị na mmasị ya n'ebe nri Naịjirịa nọ malitere mgbe enyi ya nwoke kpọọ ya gaa n’emume Ọwambe ndị Yoruba a kpọrọ Owambe, bụ ebe o riri osikapa jọlọf nakwa amala, gbegiri na ewedu ndị Yoruba. Ọ sị na o malitere ime nnyocha maka etu e si esi nri ndị Naịjirịa ma chọpụta ahịa Oyingbo dị na Legos ebe ọ na-azụta ngwa nri ndị a. Osite Mohammed kwuru na ụfọdụ nri ndị na-esi gụnyere Ofe ọha, osikapa, amala, ofe egusi bụkwanụ nke kachasị amasị ya. Kirie ihe ndị ọzọ o kwuru n'uju. Ndị mere akụkọ a bụ Ikechukwu Kalu na Vining Ogu https://www.bbc.com/igbo/articles/c87ekmnp7dvo +business Ọgba mbọ: 'E bidoro m site na-ihicha ụlọ mposi na mahadum' - Chinemerem Ezeihunne Ezeihunne Chinemerem Miriam bụ nwa akwụkwọ na Mahadun Nnamdi Azịkiwe di n'Anambra steeti ekwuola etu osiri bido ụlọọrụ na-ehicha ụlọ. O bidoro site na-ehicha ụlọ mposi mahadum ya nke ngalaba agụmakwụkwọ iwu. Kirie akụkọ nwaada a pụrụ iche n'uju ebe a: Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-55712846 +entertainment Klint da drunk: 'M bụrụ anwụ anwụ, m ga-agakwuru Boko Haram nwee mkparịtaụka udo' "Afamefuna Klint Igwemba a ma dịka Klint da drunk, kwuru ọtụtụ ihe ga-agba gị ""tam"" na ntị. N'ihe nkiri Zaa Ngwa Ngwa nke ya na BBC Igbo nwere, o kwuru maka ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị ya, ihe ọ ga-eme ma ọ bụrụ anwụ anwụ nakwa ihe ndị ọzọ. Kirie ya ka ị nụrụ ya n'onwe gị." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49191955 +politics Enyinnaya Abaribe: Ikike onye kwuo uche ya na-akawanye njo na Naijiria- Abaribe "Ikike onyekwuouche ya na-akawanye njọ ugbua - Abaribe Senetọ Enyinna ya Abaribe etiela mkpu maka ihe ọ kpọrọ ""kpachi ndị mmadụ ikwu uche ha na Naijiria."" Abaribe, onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV nwere ụbọchị Wenezde n'ihe gbasara iwu 'social media' na iwu 'Hate Speech', gbadoro ụkwụ na nwụchi a nwụchiri ụfọdụ ndị ntaakụkọ, na ndị kwuru uche ha maka ihe na-aga n'obodo. Dịka Abaribe kwuru na ya maghị n'uju ihe dị n'iwu 'Social media' na iwu 'Hate speech' n'uju, gara n'ihu gwaa ndị na-akpa nkata ime iwu a ka ha saa anya mmiri. Abaribe onye gụpụtara ọtụtụ okwu Lai Mohammed kwuru n'oge ọchịchị Jonathan sịrị na : ""Ọ bụrụ na iwu 'hate speech kwuru ka akwụgbuo onye dara ya di ire n'afọ 2012 rue 2015 oge Lai Mohammed na-ekwu ụdị okwu ọjọọ ndịa maka Jonathan, Lai Mohammed ọ kara adị ndụ ugbua?"" Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru: Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta ọsịsa Lai Mohammed nye okwu a Abaribe kwuru, mana ọ zaghị ekwentị ya. Kogi state: Ụlọomeiwu ukwu ekwela ka e binye Kogi steeti nde iri Dịka Kogi steeti na-akwado maka ntuliaka gọvanọ n'oge na-adịghị anya, ụlọomeiwu ukwu ekwenyela ka e binye ha ego.. Ụlọomeiwu ukwu akwadola arịrịọ onyeisiala Muhammadu Buharị rịọrọ ka e binye Kogi State ijeri naịra iri ka ha were kwụọ ụgwọ ha jigasị. Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-atamu na ego ahụ nwere ike ịghọ ihe ndị APC ga-eji zụọ vootu na steeti ahụ na ntuliaka a ga-eme n'oge na-adịghị anya. Ọnwụ ezutela ndị uweojii Ndị omekome agbagbuola ndị uweojii abụọ na Kaduna steeti dịka Ali Ali Janga bụ kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ si kwuo. Cheta na akụkọ kwuru na a gbagburu ndị uweojii abụọ na Bayelsa ụbọchị Tuuzde. David Villa achịliela akpụkpọụkwụ ya Nwaokorọbịa gbabuuru otu Barcelona nakwa mba Spen bọọlụ aha ya bụ David Villa alaala ezumike nka. Villa, onye nọ Japan agba bọọlụ ugbua, kwuru na ya ga-awụsa ọwa n'ọnwa Disemba mgbe afọ bọọlụ nke mba Japan ga-abịa n'isi njedebe. Esemokwu dị n'etiti gọvanọ Edo Steeti bụ Godwin Obaseki na nna ya ukwu bụ Adams Oshiomhole agafewela ọgụ nne na-agbara nwa ya. Otu jikọrọ ndị gọvanọ APC akwanyela Oshiomhole ọkụ n'ike ka ọ kpọọ ọgbakọ ndị ọnụ na-eru n'okwu maọbụ kwara ngwongwo ya rituo. Dịka ntuliaka maka ọkwa gọvanọ na-erute nso na Edo State, esemokwu dị n'etiti gọvanọ Obaseki na Oshiomhole na-akawanye njọ. Esomokwu a etisaala pati APC ụzọ abụọ, otu ụzọ na-ekwu na ha achụpụla Oshiomhole na pati ha. Mana otu ndị nke ọzọ kwuru na ọbụ Obaseki ka ha chọrọ ka o si na APC pụọrọ ha. O nwebeghị onye ma nke bụ nke. Esemokwu Oshiomhole na Obaseki pụtara ihe n'ọnwa Juun. N'oge ahụ ka onyeisi ọkaikpe nke Edo Steeti ji abalị wee duo ndị omeiwu steeti ahụ n'iyi ọrụ. N'ime mmadụ iri abụọ na anọ bụ ndị omeiwu steeti ahụ, naanị mmadụ itoolu ka e duru n'iyi ọrụ n'oge ahụ. Akụkọ kọrọ na ndị ahụ e duru n'iyi ọrụ bụ ndị na-akwado Obaseki ebe ndị ọzọ bụ ndị otu Oshiomhole. Akụkọ gbasara iwu ọhụrụ ndị ụlọomeiwu ukwu na-atule iji gbochie okwu asị ka na-akpọtụ n'elu n'ala Naịjirịa. Onye wepụtara iwu a bụ Aliyu Sabi Abdullahi bụ onye ji ọkwa Chief Whip. Ihe kpatara iwu ọhụrụ ji ewu ewu bụ na ndị mmadụ kwuru na e nwere ike iji ụdọ kwụgbuo onye a mara ikpe maka ikwu okwu asị. Ntaramahụhụ ndị ọzọ gunyere ịtụ onye dị otu ahụ mkpọrọ ndụ ha niile maọbụ ogologo afọ. Iwu ahụ kwukwara ka e kewapụta ngalaba ga na-ahụ maka mgbochi ikwu okwu asị. Cheta na Aliyu Sabi wepụtaburu iwu a n'afọ 2018 mana ọ gafeghị. Nke a mere ka o wepụtakwa ya ọzọ n'ụlọomeiwu n'ụbọchị Tuzde. Mana ọtụtụ ndị mmadụ agbarụọla ihu maka ya bụ iwu. Moghalu Kingsley kwuru na iwu ahụ kwesịrị ka a kwụgbuo ya. Shehu Sanị kwuru na iwu ahụ gosiri aka ike ndị nọ n'ọchịchị. Onye ọzọ kwuru na iwu ahụ n'onwe ya bụ okwu asị. Onye bụbu osote onyeisiala Naịjịrịa bụ Atiku Abubakar gwara ndị ụlọomeiwu Senate ka ha gbara ọgwụ ha ṅụọ gbasara iwu ọhụrụ a. Atiku kwuru na iwu ahụ ga-emegide ikike nkwuwa okwu bụ nke Bekee pkọrọ 'Freedom of speech'. O kwukwara na ọ dị ọtụtụ ihe na-emebi emebi na Naịjirịa bụ nke ndị omeiwu kwesịrị ileba anya. A ga-amachi ịrịọ arịrịọ na Borno Ekeresimesi bidoro nnọọ n'oge maka ndị arịrịọ bị na Borno State. Gọvanọ ha bụ Babagana Umara ji puku naịra iri atọ gbachaa ha niile ahụ n'otu n'otu. Ihe ruru mmadụ puku asaa ketara ego a. Mana gọọmentị kwuru na onyinye ahụ bụ iji kwadoo ha maka mmachi ịrịọ arịrịọ bụ nke a ga amalite n'oge na-adịghị anya. Nwanyị onye omeiwu na mba Bolivia aha ya bụ Jeanine Anez ejirila aka ya mee onwe ya onyeisiala dịka onyeisiala Evo Morales gbachara arụkwaghị m. Anez kwuru na dịka iwu obodo sị dị, ọ bụ onyeisi ụlọomeiwu ka o ruru n'aka irigoro n'okwa onyeisiala. Ụlọomeiwu kachasị na mba Bolivia kwadoro Anez maka ihe o mere. Ngagharịiwe na-aga n'ihu na Bolivia maka ọchịchị ọjọọ. Mmiri etojuola elu na ala n'obodo Venice dị na mba Ịtali. Nke a mere ka ụlọ obibi nakwa ụlọahịa ndị mmadụ nakwa ụlọụka dị icheiche jupụta na mmiri. Ụdị ihe dị etua emebeghị n'obodo ahụ kamgbe afọ iri ise gara aga. Mgbe ikpeazụ ihe dị otu a mere bụ n'afọ 1923. Ụlọ ejula ugbua n'ogige ndị Super Eagles dịka ha na-akwado izute mba Benin Republic na mgbede Wenezdee. Asọmpi a bụ iji tozuo maka iko mba Afrịka nke afọ 2021. Ọ ga-ebiri ọkụ n'elekere ise nke mgbede taa n'ama egwuregwu nke dị na Uyo, Akwa Ibom Steeti. Ka ọ dị ugbua, ndị otu 'Super Eagles' niile zuru ezu n'Uyo na-eche ka oge ekeremgba ruo. Ụmụ Naijirịa ewepụla onwe ha ihere Otu egwu bọọlụ Dream Team nke Naịjirịa emechapụla onwe ha ihere mgbe ha ji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie mba Zambia n'asọmpi iko mba afrịka maka ndị akarịghị afọ iri abụọ na atọ. Otu atọ kacha mee ọfụma n'asọmpi a ga-etozu ịnọchite anya Afrịka n'asọmpi Olympics nke 2020. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50401439 +entertainment Davido: Ihe nkiri na-egosi na a kụrụ ụmụagbọghọ kparịrị ya ịga "Davido enyela iwu sị hapụ ụmụagbọghọ abụọ a nwụchiri maka ibo ya ebubo ụgha. O kwuru nke a n'elu Twitter ka ndị mmadụ malitere itinye ọnụ n'okwu banyere nwụchi a. Ihe nkiri na-efegharị n'ịntanetị na-egosi ka ụmụnne abụọ boro Davido ebubo ịtụwa otu n'ime ha ime yi ịga n'aka. Nke a na-abịa dịka Davido ezigbo aha ya bụ David Adeleke, ṅụchara iyi na ọ ga-ahụ na a nwụchiri ha maka ibo ya ụdịrị ebubo a. Ụmụnne abụọ ahụ pụtara sị na ọ bụ njakịrị ka ha na-ama, na ha amaghị na ọ ga-ewuru ebe o wururu. Onye otimkpu Davido ama dịka 'Special Spesh' tinyere ihe nkiri nwụchi ha n'elu Instagram. Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti bụ Bala Elkana akatọọla agwa Special Spesh ezigbo aha ya bụ Edward Ijah kpara, na-ekwu na mmadụ nkịtị nwereike ịnwụchi ibe ya nyefee ya n'aka ndị uweojii, mana ị nweghị ikike ịgba ya n'anwụ dịka o si mee. N'ihi ihe nkiri ahụ, aha Davido malitere na-ewu na soshal midia. Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ihe dị ụmụagbọghọ ahụ mma, ndị nke ọzọ na-ekwu na ọ dịghị mma. @Biisi96 sị na ọ dị mma na ndị mmadụ si n'aka ihe a mere ụmụagbọghọ a mụrụ akọ. @london_used kwuru sị na ọ ma na enweghị ihe Davido ga-eme ụmụagbọghọ ahụ, mana ọ dị mma na o ji ha kụziere ndị ọzọ ihe, ọkachasị ndị na-akparị mmadụ n'elu soshal midia. @TORRESBLOG094 sị na ọ pụtara na Davido ""amaghị ihe bụ egwu na nke abụghị"" Ụlọikpe eweliela aka Chidoka, Ifeanyi Ubah Ụlọikpe mkpegharị dị n'Enugwu steeti ekpebiela na ọ bụ Ifeanyi Ubah meriri na ntuliaka maka oche nnọchiteanya Sineti nke Anambara Saụt, na ọ bụghị Chris na Andy Ubah nwanne ya. Ha welikwara aka Obinna Chidoka dịka onye zọtara oche nnọchiteanya nke Idemili Nọt na Saụt n'Anambara steeti, n'ụlọomeiwu nta, ma sị ụlọọrụ Inec napụta Ifeanyi Ibezi asambodo mmeri e nyeburu ya. Igbo ga-adị o! Gọọmentị Imo steeti amaala iwu sị ka e riwezie asụsụ Igbo ka ji n'ụlọakwụkwọ niile nọ na steeti ahụ site na Praịmarị ruo mahadum. N'ofesi, Praịm minista mba Lebanon bụ Saad Hariri etinyela akwụkwọ arụkwaghịm dịka ndị mba ahụ na-eme ngagharịiwe kemgbe izu abụọ maka oke ihe isi ike nakwa nrụrụaka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị. Ngagharịiwe a ebutela mgbachi ụlọakụ, ụlọakwụkwọ ma mahadum na ụlọọrụ ndị ọzọ kemgbe ụbọchị iri. Mba Lebanon so na ndị kacha jide ụgwọ n'ụwa. N'egwuregwu, Ndị otu Golden Eaglets nke Naịjiria ga-ezute Ecuador n'elekere itoolu nke abalị a ebe a na-ama aka iko mbaụwa nke ndị na-akarịghị afọ iri na asaa. N'otu aka ahụ, Manchester City ga-ezute Southampton ebe Everton bụ ebe Alex Iwobi na-agba bọọlụ, ga-ezute Watford ịma aka maka iko Carabao. Ala ezeela ma rie ndị mmadụ n'ime ụlọ ha Ala zere n'ime abalị ma rie ọtụtụ ndị mmadụ na-ehi ụra n'ime ụlọ ha na Ngouache dị na Bafoussam nke Kameruun. A ka na-achọ ndị mmadụ n'ime ala a zere ma gbuo mmadụ iri abụọ ebe otu onye na-anata ọgwụgwụ n'ụlọọgwụ. Oke ụjọọ ka dị n'ihi na ọtụtụ ndị mmadụ ka tọrọ n'ime ala dịka gọvanọ mpaghara ọdịda anyanwụ na Kameruun bụ Awa Fonka Augustin si kwuo na Redio. Gọvanọ a kwuru na mpaghara ahụ adịghị mma kama na a na-agba mbọ ịchọpụta ndị ka tọrọ n'ime ala. Idemmiri atọhapụla ndị mkpọrọ na Kogi steeti Oke mmiri zoro n'ụtụtụ ụnyaahụ mere ka idemmiri kwatuo ụlọ mkpọrọ Koton-Karfe dị na Kogi steeti ma nye ndị mkpọrọ ohere iri mbọmbọ ọsọ. Ọnụ na-ekwuru ndị ọrụ nchekwa n'ụlọ mkpọrọ a bụ Nihi Sesan gwara BBC na idemmiri kwaturu ụlọ ma ebe ndị mkpọrọ nọ. Ọ sị na ọ mabeghị mmadụ ole ndị mkpọrọ gbara ọsọ mana akụkọ na-ekwu na ha ruru mmadụ narị abụọ. Sesan gara n'ihu kwuo na ndị ọrụ nchekwa dịka DSS, ndịagha na ndị uweojii na-agba mbọ ịhụ na a nwụchigharịrị ndị a gbara ọsọ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ Williams Ovye Aya sị ndị nchekwa obodo tinyekwara aka mere ha ji nwụchie mmadụ iri atọ na otu. Gọọmentị etiti agaghị agwa anyị ego ole anyị ga-akwụ - Ndị gọvanọ Otu jikọtara ndị gọvanọ na Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị gọọmentị etiti ga-ekpebi ego ole ndị gọvanọ ga-akwụ ndị ọrụ dịka ụgwọ ọnwa opekatampe. Onyeisi ha bụ Kayode Fayemi bụ gọvanọ Ekiti Steeti sị Steeti agaghị akwụfe etu ike kwere ha. N'ofesi Ihe ruru mmadụ otu nde na ụma agaghị enwe ọkụ latrik na Steeti Kalifonịa n'ihi ọkụ na-agba n'ọzara a kpọrọ Wildfire na Bekee. Ọkụ ọgbụgba ji oke ikuku na-efesasị na mpaghara dị iche iche etinyela isi na Los Angeles n'ụbọchị Monde. Gareth na-agbara Real Madrid bọọlụ agbagidela ụkwụ n'ikike dịrị onye ma gwa Madrid ka ha hara ibipụta akwụkwọ banyere ọnọdụ ahụike ya. Akụkọ kwuru na Bale gara zute onye na-anọchite anya iji mara ọdịnihu ya na Real Madrid. Nkeji" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50217735 +sports 'Achọrọ m iji egwuregwu 'gymnastics' gaa Olimpiks - Stephanie Ịkụ ụgba bụ ihe a na-ahapụrụ ụmụnwoke na ndị mmonwụ n'ala Igbo, ọ bụ ihe e jiri mara ndị mkpọkịtị. Mana mgbe nwatakrịrị nwaanyị gbara afọ itoolu malitere kụwa ụgba, mara na ihe dị na ya. Nne na Nna Stephanie Ogechukwu Onuzuruka che na ọkpụkpụ adịghị ya n'ahụ mgbe ọ malitere ịkụ ụgba ka ọ gbara naanị afọ abụọ. Mana ka e mechara ghọta ihe dị na ya, ha malitere ịkwado ya nke bụ na ọ gaala ofesi turu ugo lọta. Lee Ogechukwu na nne ya ka ha kọọrọ gị ebe mmiri si banye n'opi ụgbọghụrụ. Ndị mere akụkọ a: Chimezie Ucheagbo na Vining Ogu https://www.bbc.com/igbo/media-54502747 +politics "Ohaneze,Massob asaala Northen Elders Forum: "" Asị! ọ bụ ndị ugwu na-egbu ọtụtụ ndị Igbo kamgbe""" "Ohaneze Ndigbo Igbo agbarụọla ihu maka ihe ha kpọrọ ""okwu asị"" na ""okwu na-akpalị iwe"" nke Onyeisi ndị otu jikọrọ ndị okenye ndị Ugwu, a kpọrọ""Northern Elders Forum"" bụ Ango Abdullahi kwuru. Northern Elders Forum eboro ndị Igbo ebubo aka ha ịdị na mmebi ihe nakwa ogbugbu ndị Ugwu n'ọgbaghara dapụtara oge EndSARS mere na nson nso a ma kwuo na ọ bụ ndị Igbo kachas i emekpa ndị Ugwu ahụ n'Ndịda Anyanwụ. Mana n'akwụkwọ mgbasaozi ozi onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo depụtara sitere n'aka onye ndụmọdụ mgbasaozi bụ Emeka Attamah n'ụbọchị Wednezde(itolu nke ọnwa Disemba), otu ahụ jikọrọ ndị Igbo kwuru na ụdị okwu ahụ sị n'ọnụ 'Northern Elders Forum' ""nwereike ibute ezigbo ọgbaaghara na Naijirịa"". Nwodo, onye kwuru na ihe Abdullahi kwuru bụ ihe nwere ike ịkpalite ogbugbu ndị Igbo bi n'Ugwu Awusa,kwuru na okwu ya ""ga-etinye ndụ ndị Igbo bi Ugwu n'ize ndu."" Ọ gwara NEF na ọ bụ ndị Igbo ka ndị Ugwu kacha egbu kemgbe. ""Ndi Igbo bụ ndị ụmụnne anyị ndị Ugwu na-awakpo na-egbusịsị kwa mgbe, ụfọdụ mgbe maka ihe mere na mba ofesi, nke o nweghị ụgwọ akwụrụla maka mbibi ndị a."" Nwodo gwakwara Abdullahi na ọ bụghị nanị maka ọtụtụ ndị Igbo ndị Ugwu na-egwu, kama ọtụtụ akụnụba ndị Igbo na-ala n'ihi oge ọgbaaghara ndị a. Nwodo dọkwara Abdullahi aka na ntị ka ya mara etu o si ekwu ọkwụ ọkachasị ugbua Naijirịa nwere etu o siri debe isi ma ya mara na ọ dị mkpa ka ọ were ndụ ya fọro afọ hụ na ọkwụ ya ga-enyere aka n'ọdịmma Naijirịa. Ha pịachiri ya bụ akwụịkwọ ozi dịka Nwodo kwuru ka gọọmentị Naijirịa gwa ndị NEF ka ha weghachi okwu dị etu a nwereike ibute ọgbaaghara. Ndị otu Movement for the Actualization of the Sovereign State Of Biafra bụ MASSOB n'aha ịchafụ azaala onyeisi Northern Elders Forum bụ Ango Abdullahi maka ebubo o boro ndị Igbo na ha gburu ndị ugwu oge ngagharịiwe endsars. Ndị ọchịchi otu MASSOB esitela n'akwụkwọ ozi onyeisi mgbasa ozi ha bụ Edeson Samuel zahachi Abdullahi were kwuo na o nweghị mgbe eji egbu ndị ugwu bị n'ọwụwa anyanwụ kama na ọ bụ ndị Arewa na-egbu ndị Igbo na mpaghara ugwu. Ha kwuru na obum n'ụche Abdullahi o ji mee njem na Rịvas steeti amụtaghị mkpụrụ, were sị ""ọ bụ atụmatụ mgbasa nke ha ga-eji were ọchịchị nke ha hụtara Nyesom Wike dịka onye ha ga-eji rụọ ọrụ a"". MASSOB kwuru na Abdullahi chọrọ ibute esemokwu n'etiti ndị Igbo na ndị nọ n'ọdịdị Naijirịa. Ha kwuru sị ,"" Ango Abdullahi bụ ihe ọjọọ mere ndị ntoroobịa Arewa, n'ihi na ọchọghị ịnye ha ohere agụm akwụkwọ, ohere ịkpe ofufe etu ha si chọọ na ohere ị bara onwe ha uru"". Ndị MASSOB duru ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ka ha hapụ ịnabata Ango Abdullahi na ndị sọ ya n'ihi na ọ kparịrị ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ na ndị Igbo niile. Otu jikọrọ ndị okenye ndị Ugwu, a kpọrọ 'Northern Elders Forum' (NEF)na Bekee eboola ndị Igbo ebubo aka ha ịdị na mmebi ihe nakwa ogbugbu ndị Ugwu n'ọgbaghara dapụtara oge EndSARS. Dịka Ụlọntaakụkọ Vanguard siri kwuo, ọ bụ onye ndu otu ahụ bụ Ango Abdullahi bụ onye kwuru nke a ụbọchi Tuzde oge otu NEF na ndị Ugwu bi na Rivas steeti nwere ọgbakọ ka ha gara njem ileta ha n'azụ ọgbaghara EndSARS. ""Ihe na-atụ anyị n'anya bụ na ndị na-eme tigbuo zọgbuo megide ndị Ugwu bụ otu ndị ahụ kachasị eti mkpu na-akpọ okpu ka eti ha aka n'obi."" N'okwu ya mgbe ha bịara izute ya n'obi gọọmenti na Pọtakọt, Gọvanọ Rịvas steeti bụ Nyesom Wike kwere ha nkwa na ọchịchị ya agaghị emegide agbụrụ ọbụla na steeti ahụ. Wike sịrị, "" Oke na ọrụ gọọmenti bụ ichekwa akụ na ụba na ndụ ndị mmadụ. Ọ dịghị etu a, ị mara na enweghị ezi ọchịchị."" Ndị so Abdullahi gaa ya bụ ije gụnyere onye bụbụ onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Ghali Umar Na'Abba; ọnye zọburu ọkwa onyeisiala n'aha pati NRC Bashir Othman Tofa na ndị ọzọ. Oyigbo dị na Rivers Steeti bidoro wube na soshal media ọzọ taa bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Novemba 2020. Ndị mmadụ nọ na soshal midia na-ajụ ihe mere e ji gbachi nkịtị maka oke ogbugbu ka na-eme ebe ahụ. Nke a mere ka anyị kpọọ otu onye bi n'ogbe ka ọ gwa anyị nke na-eme ebe ahụ ugbua. Ejike Akomas kwuru na ha zoro n'ime ụlọ kemgbe abali atọ dịka ndị agha ezitere ka ha wegahchite udo n'Oyigbo na-akwa mgbọ iji hụ na ha wetere nchekwa n'ebe ahụ. O kwuru na mgbọ ahụ ndị agha na-akwa, na-enye ha na ụmụ ha nsogbu. Akomas kwuru na ndị kpara arụ a kpatara ndị agha ji wuchie iche ebe ahụ nche agbalagala mana ndị bi n'Oyigbo na-atazi ahụhụ ya. N'ọnụ ya, ""kemgbe abali atọ, anyị enwetebeghị ihe oriri maọbụ ọgwụ igwọ ọrịa na-arịa ụfọdụ ndị bee anyị maka mmachi e etinyere n'obodo anyị. Nnamdi Omoni bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na iwu mmachị ka na-aga n'ihu n'obodo Oyigbo, ndị uweojii na ndị agha ezigara ebe ahụ ka nọ ebe ahụ, ya enwetabeghị mkpesa maka nsogbu ọbụla si ebe ahụ apụta. Omoni kwuru na ọ bụrụ na a na-egbu ndị mmadụ dịka akụkọ si efegharị na soshal midia na a ga-enwe ozu ndị si na ya bụ ogbugbu pụta, ọ gara n'ihu kwuo na akụkọ ahụ nke ndị omekome ji etinye ụjọ n'obi ụmụ Naịjiria. O kwuru na Oyigbo juru oyi ugbua. Cheta na ọgbaghara si na ngaghariwe End SARS malite mere ka gọọmenti Rivers steeti tinye mmachị ngaghari na steeti ahụ ruo ugbua. Otu n'ime mpụtara ngagharịiwe End SARS bụ na ụfọdụ ndị Ugwu na-azụ ahịa na ndida Naijiria, agbahapụwala Rịvas steeti na obodo ndị gbara ya gburu gburu ọsọ n'ihi egwu. Ndị ojiegoachụ ego n'ime ha kpebikwara ịkwụsị ibute ngwanrị na mpaghara ahụ. Nke a na-abịa dịka ọgbaghara so ngaghariiwe EndSARS tara isi ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị Ugwu ebe ngwa ahịa ha nakwa ụgbọala ha ji ebu ahị so na ihe a gbara ọkụ na Rịvas steeti na steeti ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Onyeisi otu ACF ngalaba nke Rivas steeti bụ Usman Ibrahim Tudunwada ksịị, ""Ọtụtụ ndị be anyị, ọkachasị ndị e merụrụ ahụ (n'ọgbagharaEndSARs) bidoro na-alaghachi Ugwu n'ihi ihe mere."" 'Anyị ga-akwụsị ibute ngwa nri na Rivas' Na nsonso, otu 'Arewa Consultative Forum'(ACF), ngalaba nke Rivas steeti kwuru na ha ga-akwụsị ibute ihe oriri na Rịvas steeti nakwa mpaghara Ndịda Anyanwụ n'ihi ajọ agwa ndị a na-enyo na ha bụ ndị otu Ipob kpasara ha na steeti ahụ n'ọgbaghara so ngagharịiwe EndSARS na steeti ahụ. Usman Ibrahim Tudunwada, onye bụ onyeisi otu ACF na Rivas steeti gwara BBC Igbo na ihe butere ya bụ mkpebi bụ na a gbaara ụgbọala gwongworo ha ji ebu ahịa nakwa ngwahia ha ọkụ ma gbuo ụfọdụ ndị otu ha na n'ọgbaghara so ngagharịiwe EndSARS. "" Anyị nwere mmadụ iri ndị otu Ipob gburu. Anyị ka na-achọkwa ise, ebe mmadụ iri na abụọ merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ."" Tudunwada na-arụ ndị otu Ipob aka dịka ndị kpara mkpamkpa ahụ dịka o kwuru na ndị mere ya bụ ihe ji ngwa e jirimara ndị Ipob. Ya mere o jiri were na-ajụ sị, ""Kedụ ihe anyị ga-eji na-ebutere ndị na-egbusisi anyị ma na-agba ngwahịa anyị ọkụ?"" Na nsonso a, ndị a na-eche na ha bụ ndị otu Ipob wakporo ndị Ugwu na Oyigbo na Iriebe dị na Rivas, mebie ngwahịa ha ma gbaa ụgbọala ha ọkụ na Oyigbo na nsonso a. Dịka gọvanọ steeti ahụ bụ Nyesom Wike siri kwuo, ""Ipob gburu ndịagha isi, ndị uweojii anọ ma gbaa ogige ndị uweojii ọkụ,"" ma mebikwa ọtụtụ ihe ọha nakwa ndị nọrọ onwe ha nwe. Mana Wike enweghị ihe o kwuru maka ọnụọgụgụ ndị nkịtị gunyere ndị Ugwu e gburu n'a ọgbaghara ahụ. Kọmịsọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Paul Nsirim azaghị ekwenti ya nke ọ na-asa ozi e zigara ya n'ekwentị maka ebubo nke ndị Ugwu nọ na steeti ahụ na-ebo. N'otu aka ahụ ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii steeti ahụ bụ Nnamdi Omoni gwara BBC na ọ ga-akpọchị anyị inye ọsịsa na-ajụjụ ebubo ndị Ugwu e gburu. Ọzaghị ekwentị ya oge a kpọghachiri ya nke o ji asa ozi e zigara ya n'ekwentị. Mana otu Ipob na-agọ na aka ha adịghị na ihe e mebiri na Rivas steeti. Ọkaiwu otu ahụ bụ Aloy Ejimakor kwuru na ọ bụ ndị ntorobịa mere ọgbaghara, na ọ bụghị otu Ipob. ""A na-ebochikarị ndị otu Ipob ọnụ. Ebe ọbụla Onye Igbọ na onye Ugwu nwere nghọtahịe, asị na ọ bụ ndị Ipob."" Ọ gara n'ihu sị o kwesịrị ka ndị uweojii nyocha ya bụ ihe,o nwee onye ntọrọbịa mere mpụ, sị gbaso Iwu Naijiria were taa ya ahụhụ. N'okwu na ndị Ugwu ga-akwụsị ibute ngwanrị n'a Ndịda Naijiria, "" ọkwurụ na ọ bụụ na ndị Ugwu nwere obi one Naijiria Ka ọ dị ụgbua, e nwela ụkọ ụfọdụ ngwa nri a na-esi na Ugwu Naijiria ebute na Ndịda-Anyanwụ, ebe ọnụahịa ụfọdụ nri si Ugwu abịa dịka ịyabasị gbaliri elu n'ihi oke ụkọ. Ndị ụfọdụ ụmụnwaanyị kwụpụtara, alibasa a na-azụbu otu narị naira bụzị narị naira atọ maọbụ karịa. Ahịa alịbasa so n'ihe a gbara ọkụ na ọgbaghara ahụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-54749054 +health Coronavirus: Ozi ọma maka coronavirus Ọbụghị naanị akụkọ ọjọọ ka e kwesịrị ịgbasa banyere ọrịa coronavirus. E nwekara akụkọ ọma. Kamgbe ọrịa coronavirus malitere kpawa ike, a nụla ọtụtụ akụkọ ọjọọ gbasara ya n'akụkụ ụwa niile. Akụkọ etu coronavirus si egbu puku kwuru puku mmadụ abụghịzi ihe ọhụrụ. N'ụbọchị Mọnde, ọrịa a gbukwara otu onye na Naịjirịa. Ma lee akụkọ ndị na-enye obi aṅụrị gbasara ọrịa a. Akụkọ ndị a gosiri na olileanya dị. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52001037 +politics Biafra: Ihe Ipob na Massob chọrọ - T.A Orji Onye bụbu Gọvanọ Abia steeti ma bụrụkwa sinetọ na-anọchite anya Abịa Sentralụ bụ Theodore Ahamefula Orji, ekwuola uche ya banyere Indigenous People of Biafra (Ipob) na Movement for the Actualisation of Sovereign State of Biafra (Massob) na nweta Biafra. Nke a dị n'ajụjụ ọnụ BBC Igbo gbara ya n'Umuahia, Abia Steeti n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee, afọ 2019. Ọ sị na otu ihe mere ndị otu dịka Massob na Ipob ji na-eti mkpu mmegbu bụ na onye Igbo abụbeghi onyeisiala Naịjirịa. Na ọ bụrụ na e nye ndị Igbo ọkwa onyeisiala, na ihe ndị a ga-akwụsị maọbụ dajụọ n'ebe ọ dị obere. Orji gara n'ihu rụtụ aka na nhazigharị obodo bụ ihe e kwesịrị ime iji mee ka ihe dị mma karịa ka ọ dị ugbua. O kwuru na ọ ga-adị mma ka gọomentị etiti hapụ ụfọdụ ihe dịka uweojii ka ndị steeti jide nke ha. Kirie ihe o kwuru n'uju; https://www.bbc.com/igbo/afirika-52785914 +entertainment Salman Rushdie: Gịnị dị n'ime akwụkwọ o dere na-ese okwu? "Salman Rushdie, onye dere akwụkwọ ‘Satanic Verses’ nke nọbụ n’ọnọdụ ọ-dị-ndụ-ọnwụ-ka-mma ekwuwela okwu, ebe dịka ndị dọkịta wepụrụla igwe e ji eku ume akwụnyere ya kemgbe a wakporo ya ụbọchị Fraide.. Nwoke a kpọrọ Hadi Matar Rushie ebe ọkwụ na-ekwu okwu n’ọgbakọ  ndị edemede e mere na New York dị n’ Amerika, sụkaziri n'afọ nakwa n'obi tupu ndị nọ nso na ndị ọrụ nchekwa egbobido ya. N'ụbọchị Satode, ndị nọ ya nso kwuru na o merụụ nnukwu ahụ nke bụ na o nwere ike ọ gaghịkwa eji otu anya ya ahụ ụzọ ọzọ. Rushdie bu na-ede akwụkwọ a ma ama edeela ọtụtụ akwụkwọ gụnyere ""Grimus"", ""Shame"", 'Midnight's Children bụ nke ritere ya nturuugo nwere agba bụ ""Booker Prize"" nn'afọ 1981. Satanic Verses bụ akụkọ ifo banyere ndị ụka Alakụba abụọ bi n' Ingland. Otu n'ime ihe na-ewe ndị okpukperechi Alakuba iwe n'akwụkwọ Satanic Verses bụ na Rushdie nyere akwụkụna abụọ nọ n'ime akwụkwọ ahụ aha nwunye Mohammadu abụọ. Aha akwụwkọ ahụ sikwa na ama okwu abụọ e kwuru na Mohammed wepụrụ n'akwụkwọ Nso Koran bụ nke Mohammerd kwenyere si n'aka ekwensu. Mana Rushdie kpara agụ nọ n'ụra aka n'ọdụ n'afọ 1988 oge o bipụtara akwụkwọ nke ọ kpọrọ, 'Satanic Verses,"" bụ akwụkwọ o . Akwụkwọ ahụ wuru ewu na ụwa ma kpasuo ndị ụka Alakuba na mba ụwa iwe dịka ha hụtara akwụkwọ ahụ dịka mkparị nye okpukprechi chi ha na onye Amụma ha bụ Mohammed. Ọtụtụ ha mere ngagharịiwe maka ya ma mebie ihe. E gburu mmadụ 12 na obodo ya bụ Mumbai, tụọ ụlọnnochite anya mba Briten dị na Tehran okwute. Iwe mere ka onyeisiala mba Iran oge ahụ bụ  Ayatollah Ruhollah Khomeini, nyee ntuzi aka 'fatwa' n'isi n'afọ 1989, na-akpo oku onye hụrụ nwa amadi ahụ, ya gbuo ya bụ nwa amadị a mụnyere n'ezinaụlọ ndị ụka Alakụba. Mana ndị ọkammụta na ndị gụwara isi kwuru na nke a megidere ikike dịịrị Rushdie ikwu uche ya Iran jikwa iwe sị na ha na mba Briten agaghị enwekwa mmekọ ọzọ. Rushdie malitere zọwa isi onwe ya ma na-ebigharị na nzuzo ihe karịrị afọ iri. E nyekwarere ya nchekwa ndị uweojii mana Rushdie , onye ka na-ede akedemede malitere ịpụtawa n'ọha na nsonso a. na-ekwukwa maka ikike mmadụ nwere ikwu uche ya na enweghị mgbochi ọbụla. Ọ dị ndị na-eme nka mana ụfọdụ ndị nyere ya aka tụgharịa akwụkwọ ya ahụ n'asụsụ ndị ọzọ tụnyere isi ha. Ọ nọ n'ọnọdụ a rute nsonso a ọ malitere pụawa A sugburu Hitoshi Igarashi, bụ onye tụgharịrị akwụkwọ Satani Verses n' asụsụ Japan na mahadun dị na Tokyo n;ọnwa Julai afọ 1991. N'otu afọ ahụ, a sụrụ Ettore Capriolo, bụ onye tụgharịrị akwụkwọ ahụ n'asụsụ Italy mma na Milan mana a zọtara ndụ ya. A gbara William Nygaard, bụ onye Norway egbe n'afọ 1993 na nso ụlọ ya dị n'Ohio mana ọ nwụghị. Ahmed Salman Rushdie bụ onye India a mụrụ na Bombay nke a ma taa dịka Mumbai n'abalị 19 nke ọnwa Juun afọ 1947, ka ọ gachara ọnwa abụọ India jiri nwere onwe ha n'aka mba Briten. Ọ gawara mba Briten ka ọ dị afọ 14 bụ ebe ọ nọ gawa akwụkwọ Ọ gụrụ 'History; na 'Kings College' dị na Cambridge. u.was forced into hiding after the publication of his 1988 novel, The Satanic Verses. It took nearly a decade for Rushdie to become more vocal and visible — though he continued to write stories. Today, Rushdie is widely known for being a vocal defender of artistic expression." https://www.bbc.com/igbo/articles/c2vpdjy05jlo +health Men's Health: Gịnị na-eme ime ahụ nwoke ma o mecha 'Vasectomy'? "E nwere ọtụtụ ụzọ ndị mmadụ si akwụsị ịmụ ụmụ, ụfọdụ n'ime ha bụ ihe nwoke kwesịrị ime, ụfọdụ kwa dị n'aka nwaanyị. Ndị mmadụ na-agbaso usoro ndị a iji zeere ịmụ ọtụtụ ụmụ karịa ole ha nwere ike ịzụlite nke ọma. Ụfọdụ usoro ndị a gụnyere: Ọ bụ usoro nke ikpeazụ a ka akụkọ a kọwara maka ya. Vasectomy bụ otu n'ime ụzọ nwoke ga-esị hụ na ọgaghị atụwa nwaanyị ime. Dọkịnta na-ahụ maka ịtụrụ ime aha ya bụ Olaitan Boluwatife kọwaara BBC Igbo banyere usoro a. Usoro a gụnyere ịwa akụkụ amụ nwoke ma bepụ maọbụ kechịe akwara nke na-ebu ughe (sperm) si na mkpụrụ amụ gaa ọnụ amụ ebe nwoke ga-esị nyụpụ ya. Akwara a na-ebu ughe nwoke ka Bekee na-akpọ ""Vas Deferens"". Mana ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ bụ: ""Ebepụchaa maọbụ kechịchaa akwara a, kedụzị ebe ughe akpaamụ nwoke na-emepụta na-aga? Usoro 'Vasectomy' a na-emetụta ime ahụ nwoke? Dkt. Boluwatife kwupụtara ihe olemole na-eme n'ahụ nwoke ma emechaa Vasectomy: Nnyocha gosiri na ọtụtụ ụmụ nwoke n'Afrịka amaghi maka usoro a. Ọzọkwa bụ na akụkọ ugha banyere ya dị ọtụtụ nke mere na ọtụtụ ụmụnwoke anaghị enwe mmasị ime ya. Ụfọdụ na-achị ụmụnwoke mere Vasectomy ọchị ma na-enye ha mkparị, na-ekwu na ha abụzighi nwoke Ihe kpatara nke a bụ na ha amaghi mkpa ọ dị nye ndị nwere mmasị ime ya. Otu nwoke na-achọghị ka-akpọọ aha ya gwara BBC na ọ bụ n'ihi nke a mere ya agwaghi ndị mmadụ mgbe o mere 'vasectomy'. O kwuru sị: ""Ndị mmadụ ga-ahụ gị dịka nwoke na-etozughizi oke maka ihe e mere n'amụ m"" Dkt. Boluwatife kwuru na ịkpaso ụdị agwa a nye mmadụ maka mkpebi o mere n'ahụike ya adịghị mma. ""Nwoke ka bụ nwoke tozuru oke ma o mechaa Vasectomy, ọ naghị egbochi maọbụ belata ya ịbụ nwoke,"" ka o kwuru N'izu olemole gara aga otu nwoke mba Saụt Afrịka zipụtara ozi n'akara Twitter ya na-ekwu na ọ mere oke mkpebi dị mkpa dịka nwaokorobịa dị afọ 29. Nwoke a akara Twitter bụ @JagsIsOffline dere: ""E meela m ya. I agaala mee usoro ịwa ahụ 'Vasectomy' nke enweghi ike ịgbanwe"" ""A dị m afọ 29, alubeghi nwunye, enweghi nwa ọbụla, enweghi m mmasị ịmụ nwa ọbụla. Ihe a bụ ihe gụrụ m agụụ ime kamgbe afọ olemole, ọ dị m ka na nrọ"" Ozi a tasuru ọkụ na soshal midia dịka ọtụtụ ndị kwara ya emo, ndị ọzọ kwukwara na ha aghọtaghi ya bụ usoro maọbụ ihe mere o ji mee mkpebi dị etu a. @JagsIsOffline zara ndị jụrụ ya etu o si mee ya bụ ihe, oge ole oriri ya, etu ahụ dịka mgbe o mechara ya bụ usoro nakwa ajụjụ ndị ọzọ. Ọ gara n'ihu kọwara ndị mmadụ na ọ ka tozuru oke dịka nwoke nke bụ na usoro a egbochighi ime ihe ọbụla ọchọrọ ime. Ọtụtụ na mba Afrịka aghọtabeghi maọbụ marakwanụ maka usoro a dịka akwụkwọ ozi nọ n'elu akụkọ a si gosi. Ya kpatara ọtụtụ ndị mmadụ ji akwa ndị ọzọ nwere mmasị ime nke a emo. Onye ọbụla tozuru nwereikikere ime ihe ọ chọrọ n'ahụ ya maọbụrụ na iwu mba ya kwado ya. Ndị ọrụ ahụike kwadokwara usoro a ma kwuo na enweghi ihe ọjọọ maọbụ ọghọm dị na ya nke mere ha ji nabata ya ma na-etinye aka n'usoro ịwa ahụike nke 'Vasectomy'. Ịmata ka usoro ihe si aga bụ otu n'ime ụzọ mmadụ ga-esi nwadobe onwe ya n'ụwa anyị. Nke ọzọ bụkwa ịmata uru usoro ihe ahụ bara nakwa ihe ndị dị mkpa banyere ya. Otu ihe dị mkpa nwoke ga-ama bụ na emecha 'vasectomy' ruo izu ụka olemole, nwoke ahụ ka nwereike ịtụba nwaanyị ime. Nke a bụ maka na ụfọdụ ughe (sperm) nwereike ịnọ n'ime amụ ya nke bụ na ọ nwee mmekọ, ughe ahụ nwereike ịtụba nwaanyị ime. Ndị ọrụ ahụike na-adụ ndụmọdụ ka nwoke mere 'vasectomy' ọhụrụ yiri okpunnabụenyi n'oge ọ na-enwe mmekọahụ. Ọ ga-anọrụ izuụka 12 tupu e nyochaa amụ ya mara ma ughe niile nwereike ịtụba nwaanyị ime asapụchala." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60440539 +sports Samson Siasia aghọọla 'Eron ' dịka Fifa nyere ya ọsọ ụkwụ eru ala "Otu na-achịkọta egwu bọọlụ na mbaụwa bụ Fifa achụọla Samson Siasia ọsọ ụkwụ ete aja n'egwuregwu bọọlụ maka nrụrụaka. Ha dakwara ya nha nde naira iri na asatọ n'ụma (N18.5 million/50,000 Swiss dollars). Kọmịtị Fifa na-ahụ maka agwa ziri ezi kwuru n'ozi ha wepụtara ụbọchị Fraide na ikpe mara Siasia n'ebubo ịna akaazụ were nwogharịa asọmpị ga, nke ha kwuru megidere iwu Fifa. E bidoro ikpe Siasia n'ọnwa Febụwarị afọ 2019 ka enyochachara otu nwoke a kpọrọ Wilson Raj Perumal maka ịgbalị inwogharị mpụtara asompi maka inweta chacha. Ọchụchụ a chụrụ Siasia na-eso mmachi otu na-achịkọta egwu bọọlụ na Naijiria bụ NFF machiri Salisu Yusuf, onye bụbu onye nchịkọta Super Eagles otu afọ maka ịna akaazụ. Cheta na Siasia chịkọtaburu otu egwu bọọlụ ""Super Eagles"" mgbe Sunday Oliseh." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49372230 +entertainment Dan Foster: Ihe onye mbụ were ya n'ọrụ na Naijiria na ndị ọzọ ma ya na-ekwu maka ya "Ọ bụ onye ọbịa na Naijiria maka kemgbe ụbọchị Fraide akụkọ ọnwụ ya pụtara ife, ụmụ Naijiria ọkachasị ndị ma maka Dan Foster ka na-atụ arịrị ọnwụ ya. Foster bụ olu a ma ama n'ihe gbasara igwe mgbasaozi redio na Naịjiria, nwụrụ ụbọchị Wednezde ka ọ rịachara ahụ nwa oge site n'ọrịa coronavirus. Na nkọwa ụdị mmadụ Dan Foster bụ, Chris Ubosi bụ onye nwe ụlọọrụ 'Beat FM' kọwara na ""ọ bụ ezigbo mmadụ. I nwee nsogbu ọbụla, Dan ga-ewe ya ka nke gị"". Ubosi, onye si na ịbụ onyeisi ya bụrụ ezigbo enyi Dan Foster kọwara na ""Dan bụnụ onye Naijiria. Ị hụkwanụ ya, akwa Naijiria ka ọ na-eyikarị, nri Naijiria ka na-amasị ya."" Ubosi bụ onye mbụ so gbaa Foster ajụjụ ọnụ e jiri wee ya n'ọrụ mbụ ya na Naijiria sị na ""ezigbo onye ọrụ na-arụkarịa ole e ziri ya rụọ."" Ihe ndị ọzọ a ma ama na-ekwu maka ya Ihe ise ị maghị maka Dan Foster 1. Dan Foster bụ onye Amerika lụrụ ọrụ na ụlọọrụ mgbasaozi na Amerịka tupu ọ bịa Naijiria. 2. Ebe mbụ ọ lụrụ ọrụ bụ na Ụlọọrụ redio 'Cool FM' 3. O biela na Naijiria afọ 20 ma lụgharịa onye Naijiria Igbo dịka ya na nwunye mbụ ya, mụtara ya otu nwa gbasara. 4. Foster a na-etu 'Big Dawg' lụrụ onye Igbo, nwa ada Enugwu aha ya bụ Lovina, ha mụkọrọ ụmụ abụọ. 5. Ejiji Naijiria na nri ha na-amasị Dan Foster nke ukwu" https://www.bbc.com/igbo/afirika-53095748 +entertainment Igbo festivals: Iri ji Mbaise agbajuola dọrọ tata Mmemme Iri Ji Mbaise na-akpọtụ ugbua n'ụlọakwụkwọ 'Aboh Mbaise Secondary School' ebe obodo 91 mejupụtara Mbaise na-eri ji ọhụrụ taa bụ Tọzde. Iri ji Mbaise bụ nke a na-eme kwa afọ ọbụla ma ọnwa August gbaa iri na ise. Mmadụ puku kwụrụ puku zukọtara kemgbe ụtụtụ ụbọchị Tọzde, ebe ndị mbaise na egosi ejiri mara ha. Ndị Eze-Ji niile bugasi ji gbara agba si na obaji ha bịa gosi ya ka ụwa kirie. Eze-Ji HRH Eze Mike Ndudiri Orji kwuru na obodo Mbaise bụ ndị kasi ibe ha akọpụta ji, nke mere na ha na ebu ụzọ eme mmemme iri ji tupu obodo ndị ọzọ eriwe. Ihe nkiri omenala juputara na iri ji Mbaise nke afọa gụnyere egwu omenala dị iche iche, ịgba mgba, ekike, ịgosi ọba ji nakwa ihe ndị ọzọ. Lee ihe nkiri iri iji nke ndị mba ọzọ: Lee akuko ga-amasị gị https://www.bbc.com/igbo/institutional-49359795 +business e-Naira CBN: Ihe mere e ji wetuo akụrụngwa eNaira n'ọba ozi 'Google Play Store' ma tinyekwa ya ọzọ "Ụlọakụ etiti bụ Central Bank akọwaala ihe mere e ji wetuo akụrụngwa eNaira n'ọba 'Google Play Store' nwa ntịtị oge tupu e tinyekwa ya ọzọ. Dịka Osita Nwanisobi, bụ ọnụ na-ekwuru CBN kwuru na ha na-arụ ya ọrụ iji. ""Anyị na-arụ ọrụ na ya ugbua, nwalee ya n'ime awa olemole na-abịanụ,"" Nwanisobi gwara ndị ntaakụkọ Punch n'ụbọchị Wenezde. Mana oge BBC Igbo nwalere ya n'ụtụtụ Tọzde, anyị hụrụ na ya bụ akụrụngwa dịkwa na 'play store'. Anyị chọpụtakwara na ụfọdụ ndị buturula ya bụ akụrụngwa n'ekwentị ha kwuru na ọ na-enye ha obere nsogbu. Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ na onyeisala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ga-ewepụta ego teknụzụ ọhụrụ akpọrọ e-naira n'ụbọchị Mọnde na-abịanụ. e-Naira bụ ego teknụzụ mbụ Naịjirịa nwerela. Ọ bụ n'ọnwa Sepụtemba nke afọ 2021 a ka ụlọakụ gọọmenti etiti akpọrọ CBN n'aha ịchafụ wepụtara ya bụ webụsaiti e-naira. Etụ eNaira ọ ga-esi rụ ọrụ CBN ga-ewepụta ego pụrụiche nke naira nọ n'isi ya. Ka ọ dị ugbua, ọba ozi ego teknụzụ ahụ abụbeghị nke mmadụ niile ga-enwetali. Mana CBN na-ekwu na ha na-agba mbọ ịhụ ndị mmadụ nwerike ịnwetalị 'app' ya n'ekwenti dị iche iche dịka ""Google Play store nke Android users"" nakwa App Store maka ndị nwere ""iPhone."" Ndị chọrọ ị ji ego naira teknụzụ a azụ ahịa ga-akpọ otu akara ""USSD short code"" ma soro usoro ahaziri iji jiri ego ahụ zụọ ahịa maọbụ kwụọ ụgwọ. Osita Nwasinobi bụ ọnụ na-ekwuru ụlọakụ CBN kwuru na mwepụta e-naira a ka bụ nzọpụ ụkwụ nke mbụ. o kwuru na ọ ga-anagbanwe kwa mgbe ma na-akawanye mma. Ọ bụrụ na onyeisiala wepụta ya bụ ego naira teknuzu(e-naira), lee ụfọdụ ihe ndị ị ga-ejinwu ya mee Ihe ụlọakụ etiti ji wepụta CBN e-Naira Ọ bụ Bitt Inc. rụpụtara e- Naira ma mekwa ka ewepụta ego teknụzụ nke CBN nke akpọrọ Central Bank Digital Currency (CBDC). A ga na-eji ma ego naira nkịtị nakwa nke teknụzụ(e-Naira) azụ ahịa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59027761 +business Second-hand cars: Ntụbata ụgbọala anyarala anya ga-emebi ahia anyị' - Innoson Ụgbọala anyarala anya bụ ezigbo ahịa na-aga ahịa na Naịjirịa nakwa gburugburu Africa. Mba China dịka ha tetere n'ụra ọhụrụ wee sị ka ha soro mịta nnukwu akụ na ụba si na ya bụ ahịa apụta nke mere ka ha malite ịtụbata ụgbọala anyarala anya na mba Africa, Asia nakwa Europe. Ngụkọ pụrụiche na-egosi na nani ụgbọala anyarala anya melitere n'ogo pasenti iri asatọ (80%) ego si na azụmahia ụgbọala pụta na Naịjiịa n'afọ 2016. Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa na-ekwu na atumaatụ a ga-amagbu onwe ya mana otu onye Igbo bụ naanị ụlọọru ya na-emepụta ụgbọala na-ekwu na ya bụ atụmaatu ga-emebiri ya ahịa. Mana o kwuru na onweghị onye Naịjirịa ụta dịrị makana ego ụgbọala anyarala anya dị ọnụ ala. Innoson kwuru na ọ bụrụ na onye na-emepụta ụgbọala na Naịjirịa ezi nkwado, ụgbọala ọhụrụ ga-eruteli onye ọbụla aka makana etu ihe si dị na Naịjịria ugbua anaghị enyecha ndị mmepụta ihe ohere irite uru dịrị ha. Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụta n'ọnụ Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru gọọmenti n'ekwenti kpụrụ n'ala. Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-49177629 +health Sexual Abstinence: Lee ihe ga-eme ahụ gị ma ị hapụ ime aramara oge tere aka "N'agbanyeghị na ọ dịka aramara o juru ebe niile ugbua, e nwere ụfọdụ ndị kpebiri na ha agaghị eme aramara. Ọtụtụ ndị bụkwa ndị anaghị enwe mmasị ime aramara kwadaa, n'ihi otu ihe maọbụ nke ọzọ. Nnyocha sayensi gosiri na e nwere ọtụtụ uru dị na nwoke mọbụ nwaanyị ị na-eme aramara kwa mgbe kwa mgbe. Mana ọtụtụ na-ajụ ma onwere ihe ọghọm maọbụ mperi nye ahụike mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahụ anaghị eme aramara chaachaa, maọbụ ọ naghị eme ya kwadaa? BBC Igbo kpọtụụrụ Dibia bekee aha ya bụ Udodi Okoli, onye gbalịrị ịza ajụjụ a. Emeghi aramara anaghị emetụta ahụike mmadụ Dọkịnta Okoli, onye na-arụ ọrụ n'Akwa Ibom, kwuru na ""ọ bụrụ na mmadụ sị na ọchọghị inwe mmekọ nwoke na nwaanyị, nnyocha sanyesi ekwughị ihe ọbụla banyere ọghọm ahụike so mkpebi a."" Ọ sị; ""Ọ bụrụ na mmadụ jiri anya ọcha hapụ ime aramara nke na-abụghị na mmanye, ahụike onye ahụ ga-akwụ chim"". O kwuru sị naanị ihe sayensi kwuru maka nke a bụ mmetụta ahụike ụbụrụ nke Bekee kpọrọ ""Mental Health"" ""Aramama na-enyere ụfọdụ ndị mmadụ aka ibelata ahụ mgbakasị nke bekee na-akpọ 'stress'"", Dr Okoli kwuru. N'otu aka ahụ, Malik Haruna King bụ dọkịnta ma bụrụkwa ọkachamara n'aramara, gwara BBC Igbo na enweghị ihe pụrụiche na-eme nwaanyị ma o tee aka tupu ọ nwee aramara. King kọwara sị, ""Ị lee anya, e nwereike igbochi ahụ mmadụ ịrụ ọrụ aramara ma enweghị ihe ga-eme onye ahụ, mana e gbochie mmadụ iri nri maọbụ ịga mposi, onye ahụ agaghị adị ndụ"". O kwukwara na nwaanyị ọbụla na-emeghị aramara oge tere aka ga-ebi ndụ ya etu ndị na-eme aramara ga-esi ebikwa. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Robert gwara BBC na ụfọdụ ndị enyi ya na-akọ ya ọnụ n'ihi na ọ naghị enwe aramara kwadaa. Robert sị na ya na nwaanyị enwebeghị mmekọ aramara kamgbe afọ 2018 ""Ndị mmadụ menyere m ihere maka mkpebi ịwepụ aka n'aramara. Ụfọdụ na-eche na m bụ nwoke na-achọ ime mmekọ nwoke na nwoke,"" Robert kwuru. Okwu a ndị mmadụ na-agwa ya metụtara ọnọdụ ahụike ụbụrụ ya. N'afọ 2017, nwaada ọkpaọchị a ma ama na Naijịrịa dịka Chigul, kwuru na ya na nwoke ọbụla enweghị mmekọ ruo oge ọ lụrụ dị. Chigul kwuru nke a na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ Kemi Adetiba nwere n'afọ 2017. ""Alụrụ m di mgbe m dị afọ 33, amaghi nwoke ọbụla tupu m alụọ di"" Ọ kọwara na mkpebi ahụ na-akpa ya obiọma, ma bụrụkwa nke enweghị ọghọm ọbụla nye ya. Emeghị aramara anaghị ebutere nwoke ọrị 'prostate cancer' Ụfọdụ na-eche na nwoke anaghị enwe aramara kwa mgbe kwa mgbe nwere ike inwe ọrịa 'prostate cancer', mana dọkịta Okoli kwuru na nke a abụchaghị eziokwu. Okoli kwuru na ọ bụ eziokwu na nnyocha sayensi gosiri na nwoke na-anaghị ewepụ uhe ya (sperm) kwa mgbe kwa mgbe site n'ụzọ aramara maọbụ ịgbọ ncha, nwereike ibute ọrịa 'Prostate Cancer'. ""Prostrate"" bụ akụkụ ahụ nwoke na-emepụta uhe. Mana Okoli gara n'ihu kọwaa na ụfọdụ oge, ahụ nwoke na-eji aka ya gbapụ uhe kariri akari n'ime ahụ onye ahụ site na nrọ nke a na-akpọ ""wet dream"" na bekee. N'aka nke ụmụ nwaanyị, otu mperi dị n'ịnọte aka tupu emee aramara bụ na aramara ahụ nwere ike ịfụ ya ụfụ. Otu nwa agbọghọ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kọọrọ BBC na enwere mgbe enweghị aramara mekpara ya ahụ. O kwuru sị, ""Dọkịnta abụọ m hụrụ gwara m na ọ bụ maka anaghị eme aramara ka nsọ m ji afụ m ụfụ"". O kwukwara na ndị dọkịnta ahụ gwara ya na enweghị aramara nwereike ibute ogbeke (Fibroid) n'akpa nwa ya. ""Ndị dọkịta a gwara m na ọ bụrụ na m lụọ di, mgbu ịhụ nsọ m ga-akwụsị ma m malite inwe mmekọahụ mgbe niile,"" nwaanyị a kwuru. Mana ọ sị na kamgbe ọ lụrụ dị, ""enweghị 'fibroid' dị n'akpa nwa m, onweghịkwanụ nnukwu mgbanwe ọ chọpụtara n'ahụ ya.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-59999138 +business Femi Otedola: Ugboro atọ ya, Tolani na ụmụ ya ndị ọzọ wuru na soshal midia "Ojiegoachụego a ma ama bụ Femi Otedola bụ onye akụkọ banyere ya na-adị ntị ụmụ Naijiria mma oge ọbụla nke mere ndị ntaakụkọ na-eji ya eme isiokwu. Ụmụ ya atọ bụ Cuppy, Tolani nakwa JTO so ya ewu na soshal midia taa maka ihe o meere ha. Ọgaranya bụ omume omume ma ọ bụrụ onye otiegwu, ọ na-eme ihe dịka ọ siri gụọ ya. Lee ụfọdụ ugboro Otedola bụ nwa gọvanọ chịbụrụ Legọs bụ ‎Michael Otedola wuru ewu na soshal midia: 1. Ọ zụrụ ụmụ ya ụgbọala atọ dara N80,000,000 n'otu ụbọchị Taa bụ Wenezde, o bidoro iwu na soshal midia dịka ọ pụtara ihe na ọ zụrụ ụmụ ya atọ ụgbọala Ferrari atọ. Ọ bụ nwa Otedola nke nwaanyị na-agwọkọ egwu bụ Florence Otedola a ma ama dịka 'DJ Cuppy' bụ onye gbara ama nke a na soshal midia. Ụmụ ya nwaanyị atọ ritere erere ahụ bụ; Tolani Otedola( ọgụegwụ, Florence Ifeoluwa Otedola(DJ Cuppy- ọgwọkọ egwu) na Temi Otedola. Ya bụ akụkọ chọrọ ịgbawa ịntanetị n'ihi na ụgbọala Ferrari Portifino ahụ Otedola zụrụ ụmụ ya atọ na-ada ihe karịrị ruru nde Naira iri asatọ(N80,000,000) maọbụ narị dọla abụọ na ụma iri na asatọ( $218,750). Aha Femi Otedola kpọtụrụ n'afọ 2018 oge ihe onyonyo gosiri ya ka ọ banyere ụgbọala 'Molue' na Legos fegharịrị na soshal midia. Molue bụ ụgbọala e jiri mara ndị ụwa na-atụ n'ọnụ a Legọs nke mere ya bụ ihe jiri bụrụ nnukwu akụkọ dịka ndị mmadụ na-ajụ ihe mere n'ọgaranya iri ehi nwere ike ịbanye ụgbọala ahụ. Ụfọdụ bidoro na-ekwu na ikekwe ọ chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị, ebe ụfọdụ na-ekwu na ọ chọọ ịma etu ụwa onye ogbenye na-adị. Ọgaranya bụ iri ihe gụrụ gị mgbe ọ gụrụ gị oge ọ gụrụ gị. Femi Otedola na ụmụnwaayị agatụla Monaco dị na mba Italy nọọ naanị otu awa iji zụụ 'Ice Cream gụrụ ha a kpọrọ ""Gelato""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-54180230 +politics Onweghi ihe ọjọọ Rochas buru Eze Ilomuanya n'obi - Ọnụ na-ekwuchitere Okorocha Onye bụbu aka na-achị Steeti Imo bụ Rochas Okorocha na onye Eze Obinukwu bụ Eze Cletus Ilomuanya nọrọ n'ụtụtụ ụnyaahụ were egbe ọnụ saa onwe ha ahụ n'ọdọụgbọelu Sam Mbakwe dị n'Owere. Akụkọ kwuru na Eze Ilomumanya sị na ihe na-eme Okorocha si ya n'aka, ebe Okorocha gwara ya na onweghi obi mwute ịwepụ ya dịka onyeisi ndị Eze ọdịnala n'oge ọ bụ gọvanọ. Okorocha kwuru na e nyekwuo ya ohere ọzọ ịbụ aka na-achị steeti ahụ, na ọ ga-eme ya ma mekwasị ọzọ. Okorocha na onye Eze a nọkọrọ ọnụ n'oche n'ime ụgbọelu ahụ mgbe ha bidoro na-abara onwe ha mba. Ndị nọ n'ụgbọelu ahụ mechara bịa gbosaa Okorocha na Ilomuanya ma nye ha oche na-adịghị nso onwe ha. Cheta na mgbe Okorocha na-achị dịka gọvanọ Imo Steeti na o wepụrụ Eze Ilomuanya n'ọkwa onyeisi ndị Eze ọdịnala nke steetị ahụ. Ọnụ na-ekwuru Okorocha bụ Sam Onwuemedo gwara BBC Igbo na ọ nọghị n'ụgbọelu mgbe ihe ahụ mere kama na ọ nụrụ ya n'akụkọ. Ọ gara n'ihu katọọ agwa Eze Ilomuanya kpara ma sị na onye ọbụla maara Rochas dịka onye udo na ịhụnanya. Ọ gara n'ihu kwuo na anaghi abụ anụ nwụrụ anwụ n'ezi. O kwuru na Okorocha ịnọkwuru ya na akụkụ gosiri na o nweghi ihe ọjọọ okorocha buuru ya n'obi. https://www.bbc.com/igbo/afirika-56567738 +politics Rochas Okorocha metere ihe mere mmụọ jị achụ ya ọsọ - Gọọmentị Hope Uzodimma "Gọọmentị Imo steeti asaala okwu onye bụbu Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha kwuru banyere onye nọchịrị anya ya bụ Hope Uzodinma. Okorocha kwuru na Uzodimma kpọrọ ya asị dị egwu nke ya amaghị ihe kpatara ya dịka ya na ụlọ ntaakụkọ Channels na-eme mkparịtaụka banyere ọnọdụ ọchịchị nakwa nchekwa na Naịjirịa ugbua. Dịka onye ntaakụkọ Channels bụ Seun Okinbaloye jụrụ Okorocha maka esemokwu dị n'etiti ya Uzodinma, ọ sị na ya anaghị esesa gọvanọ ya okwu, na ọ bụ ya na-esesa ya okwu. ""Amaghị m ihe mere Uzodinma. Ọ na-ebuso m agha oge niile mana ekwere m onwe me nkwa na agaghị m emegwara. Ọ na-emere m ụfụ anya."" Okorocha gara n'ihu kwuo na ndị uweojii jichiri ndị ọkwọ ụgbọala ya nakwa ndị ọrụ ya ndị ọzọ n'Imo steeti kamgbe abalị ise gara aga. ""Ugboro ugboro ka ndị uweojii jichiri m, ma n'Imo steeti ma n'Abuja,"" Rochas na-ekwu. ""Ugboro ugboro ka e mebiri ụlọ m na akụnụba m ndị ọzọ."" ""Mana n'ime ihe niile a, ihe m na-ahụ bụ naanị akpọmasị, o nweghị ihe ọzọ."" Okorocha gara n'ihu kwuo na ya ma na ya busowe Uzodinma agha ọ ga ebute nsogbu karịa nke a na-ahụ ""n'ime steeti m tara ahụhụ wunlite"". Ọ kọwara na a na-ebo ya ebubo nrụrụaka mana nke bụ eziokwu bụ na ya nwere ego tupu ya abụrụ gọvanọ. ""Ihe ndị mmadu na-echezọ bụ na abụ m Rochas tupu m bụrụ gọvanọ."" Gọọmentị Hope Uzodimma, n'ozi Ode Akwụkwọ Mgbasaozi ya bụ Ogwuwike Nwachukwu binyere aka, sị na ọ bụ mkpọtụ ka Okorocha na-eme. Ha sị: ""Ndị Naịjirịa ekwesighi ige ya ntị. Ọ bụ mmụọ ya na achụ ya maka etu o siri mebie steeti ọ chịrị afọ asatọ."" Ozi a sị na ebe ndị Imo ""nwere ike ịgbaghara ya mana ha enweghi ike ichefu ihe o mere ha"". Ha sị na Gọvanọ Hope Uzodimma na-ekpochapụ ihe niile Okorocha mebiri." https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-57147602 +business Ọgba Mbọ: Ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya na m banyere n'ịrụ akpụkpọ ụkwụ - Ifeoma Chidebe "Ifeoma Chidebe bụ nwaagbọghọ nwere mmasị n'ịrụ ọrụ aka kọwara etu o si banye n'ịrụ akpụkpọụkwụ karịa ịrụ ọrụ Bekee. Nwaada a kwuru etu ndị mmadụ si wee na-ajụ ya ma ""uche ya adịkwa ya"" dịka ọ gwara ha na ọ chọrọ ịga mụọ ya bụ akaọrụ. Ma kwuo etu o si gụchaa mahadum tupu ọ banye n'ọrụ a, ma kwuo na ọ bụ kemgbe ọ dị na nwata ka o jiri malite inwe mmasị maka ihe o ji aka ya rụpụta. Ọ kọwara na olileanya ya bụ ịgaru mba Itali bụ ebe a ma ama maka iji ezigbo akpụkpọanụ arụpụta akpụkpọụkwụ na ihe ndị ọzọ. O kwukwara na o nwere olileanya inwe nnukwu ebe nrụpụta ọrụ nke Bekee kpọrọ 'Factory' n'ọdịnihu. Ndị mere akụkọ a bụ Uche Akolisa na Nnamdi Agbanelo" https://www.bbc.com/igbo/afirika-54151095 +politics Referendum Ipob: Peter Obi chọrọ ịbụ osote onyeisiala, Ipob chọrọ Biafra - Paul Achalla "Nke na-afịọ ugbua bụ na Ipob, bụ otu na-achọ ka ekewapụta mba ọhụrụ a kpọrọ Biafra na Naịjirịa, chọro ka ewere ụbọchị 16 nke ọnwa Febụwarị mee atụmatụ Bekee kpọrọ, ""Referendum"". Ọtụtụ mmadu na-ajụ ihe nke a pụtara makana Ipob sịbụ na ọ bu ""nọdụ n'ụlọ"" ka ha chọrọ ka ndị otu ha mee n'ụbọchị ahụ. BBC Igbo tunyere otu n'ime ọkaiwu Ipob bụ Paul Achalla ajụjụ n'ọnụ ka ọ gwa ọha nke bụ eziokwu. Maazi Achalla gwara BBC na nke bu eziokwu bụ na ihe Ipob chọrọ bụ ka ụwa maka na o nwere ndị achọghi ntuliaka a Naịjirịa na-eme site ịnọdụ n'ụlọ ụbọchị ntuiliaka ahụ. Achalla sị, ""Ndị si mba ofesi bịa ịhụ etu ntuliaka aka ahụ ji aga ga-ahu na ndị be anyi ajụgo Naịjirịa, jụ ihe niile dị ya n'ime."" Ọ gakwara n'ihu kwuo na ""referendum"" ha ga-eme ka onye pụtara ka onyeisiala ghara inwe ikike Bekee kpọrọ, ""Legitimacy"". Banyere okwu Onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo kwuru maka atụmatụ referendum ahụ, Paul sị na okwu ya adabachaghị makana aghụghọ dị na 'restructuring' ahu ọ na-ekwu okwu ya. Gee ya ntị n'olu: Maazi Achala gakwara n'ihu kọwa ihe mere ha ji na-esi ọnwụ maka nwere onwe na atụmatụ ""referendum"" a. Ọ sị na onweighi isi ị si ka esoruru Naịjirịa dịka Nnia Nwodo kwuru makana ekwesiri ime ka ndị mmadu mara ebe uche ndị mmadụ dị ugbu a, nakwa ịnapụ gọọmenti ikike ọha kwuo ha ji arụ ọrụ. Maka Peter Obi bụ nwaafọ Igbo na-azọ ọkwa na pati sepụtara isi bụ PDP, Achalla sị na ihe Ipob na-achọ karịrị Peter Obi, ma kwukwa na ndị ndọrọndọrọ n'ọwụwa anyanwụ nwere ihe jikọrọ ha na Naịjirịa. Lee ihe Nnia Nwodo kwuru maka atụmatụ referendum ahụ:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-47068297 +health Covid-19 n'otu nkeji: 'Menthol' ọ na-egbochi ọrịa coronavirus? E nwere ihe onyonyoo na-efesa na soshal midia ugbua ebe onyeisiala mba Guinea bụ Alpha Conde na-ekwu na ite ihe na-ekpo ekpo bụ 'menthol' n'imi nwere ike igbochi mmadụ ibute ọrịa coronavirus. O kwukwara na mmiri ọkụ na-egbochi ya bụ ọrịa. Mana ihe ndị a bụ akụkọ mbe agaba, maka na onwebeghi nnyocha gosiri na ihe ndị ahụ dị ire. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chukwunaeme Obiejesi https://www.bbc.com/igbo/afirika-52476161 +business Anambra Sit at Home: Onitsha 'Main Market' o mepere taa bụ Mọnde? Lee ihe anyị hụrụ Onitsha Main Market dịka ebe agbara ọsọ n'ụtụtụ taa bụ Monde, March 28, 2022. Ndị ahịa apụtaghị maọlị belụsọ ndị mmadụ na-agara onwe na nke nke n'okporoụzọ. Ọdọ ụgbọala ebe ndị ọkwọ ụgbọala na-eme njem aga-ebe dị iche iche n'ala Igbo mechichara emechi. Okporoụzọ Upper Iweka na-ekwokarị ekwo dịka ebe ndị mmụọ chụsasiri ndị mmadụ ọsọ makana ị ga-agụtalị mmadụ olemole nọ ebe ah��� n'ụtụtụ taa. Nke a na-abịa agbanyeghị nzukọ ndị isi ahịa na aka na-achị anambra steeti bụ Charles Soludo nwere n'izu ụka gara aga. Na nzukọ ahụ, ha kwekọrịtara na ndị ahịa ga-emepe ahịa ụbọchị Mọnde ọbụla agbanyeghị na ndị mmadụ na-anọbụ n'ụlọ ụbọchị ahụ. Lee ụfọdụ foto anyị setere ebe ahụ. Ọdọ ụgbọelu dịketere Upper Iweka dị n'Onitsha tọgbọọ chakoo Na Jerome Udorji ebe Secretariat nke Anambra steeti dị , onye ntakụkọ anyi hụrụ ndị ọrụ ka na-abịa edenye aha ma tụgharịa azụ lawa. Lee ka ihu na anya dị ụfọdụ ebe n'Awka dị n'Anambra steeti. Ndị na-akwọ ụgbọala ndị ọrụ ji aga ọrụ na secretariat apụtaghị bia buru ụgbọala kwọga ndị ọrụ n'ụtụtụ a. Ọtụtụ ọdọ ụgbọala tọgbọkwa chakoo agbanyeghị na ndị ọkwọ ụgbọala biara ya bụ nzụkọ gọvanọ Soludo na ndị ahịa mere. Anambra steeti Judiciary dị n'Awka tọgbọọ chakoo. A hụghị kama otu onye ebe ahụ. A hụtụrụ mmadụ n'Aroma junction. Ndị mmadụ apụtaghị etu ha si apụtabu n'Eke Awka n'ụbọchị ndị ọzọ. Unizik Junction Awka N'Abakaliki dị n'Ebonyi steeti, Ndị ọgbatum tum na-agagharị mana ahụghị ndị na-eme njem tere aka na-agba n'ụzọ taa. N'Enugu, Ọtụtụ okporoụzọ dị n'Enugu tọgbọọ chakoo dịka ndị mmadụ nọ n'ụlọ taa bụ Mọnde March 28, 2022. N'Umuahia, okporoụzọ Akara - Uturu n'okpuru ọchịchị Ovim Isuikwuato dị n'Abia steeti. Okporoụzọ Osusu a na-esi aga Faults, ahia Ariaria nakwa ebe a na-esi amapụta okporoụzọ Port Harcourt na Enugu tọgbọọ chakoo. Ụlọahịa ndị dị n'okporoụzọ Wethral dị n'Owerri mechichara emechi. Gịnị butere 'sit at home' ndị Ipob hibere? Ndị otu Ipob malitere ịnọ n'ụlọ ha kpọrọ 'sit at home' mgbe gọọmentị etiti Naịjiria nwụchiri Kanu bụ onyendu ha, n'afọ 2021. Ha tinyere ya bụ ịnọ n'ụlọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiria iji gosi nkwado ha maka ikpe Kanu. N'afọ 2021, ha tinyere ya bụ ịnọ n'ụlọ kwa Mọnde ọbụla, mana ha mechara na-eme ya mgbe ọbụla Kanu kwesịrị ịpụta n'ụlọikpe. Cheta na gọọmetị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu bụ onye ndụ otu Ipob na na mba Kenya n'afọ 2021 ebe ọ gbara ọsọ n'afọ 2017 mgbe ndị agha Naịjirịa wakporo ụlọ ya n'Afaraukwu Abia steeti. Kamgbe e si mba Kenya kpọlata ya Naịjirịa, a na-ekpe ya ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu nke gọọmentị Naịjirịa na-ebo ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-60900224 +health Covid-19: 'Ọ bụ n'ọnụ onyeisiala ka m nụrụ na m bụ ọrịa coronavirus' "Sita Tyasutami na nne ya Maria Darmaningsih bụ mmadụ abụọ bu ụzọ bute ọrịa coronavirus na mba Indonesia. Kama ihe mere ka ọnọdụ ha pụọ iche bụ etu ha siri mata na ha bu ya bụ ọrịa. Nne na nwa gara ụlọọgwụ dịka ha na-egosi njirimara ọria coronavirus ma na-eche ka agwa ha mpụta nnyocha emere ha. Kama ọ bụ mgbe ha na-ele ihe onyonyo oge Onyeisiala Indonesia bụ Joko Widodo na-agwa ndị mba ahụ okwu ka ha matara na ha bu ọrịa coronavirus. Onyeisiala Widodo kwuru na mgbasa ozi ya were sị na Indonesia enwetela mmadụ abụọ mbụ bu ọrịa coronavirus. Widod kpọrọ afọ ole ndị ahụ dị, ụlọ ọgwụ ha nọ na ndị ha na ha nwere mmekọ. Akpataoyi wụrụ Tyasutami n'ahụ dịka ọ chọpụtara na ọ bụ ya na nne ya ka onyeisiala na-ekwu maka ya. O wutere ya na ọ bụ n'ihe onyonyo, site n'ọnụ onyeisiala ha ka ha ga-eji mara na ha bu ọrịa coronavirus. Mgbe olu bidoro ịkọ Sita ọkọ, o nweghị ihe ọ kpọrọ ya tupu ya eruo ụtụtụ ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Febuwarị mgbe ahụ ya biara mesiwa ya ike. Nne ya bụ Darmaningsih na-arụ ọrụ dịka onye nkuzi na Mahadum ndị na-agba egwu dị na Jarkarta, dakawra ọrịa ma ha abụo amaghị ihe na-eme ha. Ha gara ụlọọgwụ ebe dọkinta gwara Tyasutami na ọ nwere ọrịa ""Typhus"" ebe nne ya nwere ""Broncopneumonia"". Ha gwara ndị ụlọọgwụ ka ha mee ha nnyocha maka coronavirus kama ndị ụlọọgwụ jụrụ n'ihi na ha enweghị akụrụngwa e ji eme nnyocha. Ọ bụ n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Febuarị mgbe otu enyi Tyasutami gbara ya ama na ya bụ Tyasutami gara otu ọgbakọ ndị egwu ebe otu nwaanyị si mba Japan bụ ọria coronavirus biakwara. Mgbe ahụ ka Tyasutami matara na agwọ nọ n'akịrịka. Tyasutami kwuru sị ""ugbua ka m siri ọnwụ were gwa dọkinta ka ha nnyochaa anyị maka coronavirus"". Dọkịnta kwetara ugbua ma edopụkwara ha iche n'ụlọọgwụ pụrụiche maka ndị bu nje. Ọ tụrụ Tyasutami na nne ya Darmaningish n'anya na ọ bụ n'ọnụ onyeisiala ka ha ji mara na ha bu ọrịa coronavirus. Ọ bụ mgbe abalị abụọ gara ka a gwara Tyasutami na Darmaningish na iwu obodo Indonesia nke ehiwere n'afọ 2009 na-ekwu na mgbe ọbụla e nwere ọrịa zuru ụwa ọnụ, na ọ bụ onyeisiala ka a ga-ebu ụzọ gwa. Kama ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị mba Indonesia bụ Achmad Yurianto gwara BBC na ọ bụ etu a ka iwu ha dị. N'aka nke ọzọ nwanne Tyasutami bụ Ratri Anindyajati kwuru sị "" ndị mmadu na-ata nwanne m ụta na ọ bụ ya butere ọrịa a na mba anyị, ọtụtụ na-ata kwa ya ụta na ọ bụ ya mere e jiri chụọ ha n'ọrụ"". Dịka onyeisiala kwuchara okwu ya, mkpọbịrị aha Tyasutami na nne ya, akara ụlọ ha ma ihe gbasara ahụike ha jupụtara na ""Whatsapp"". Tyasutami kwuru sị ""tupu m bute ọrịa coronavirus, enweghị onye na-agwa m okwu ọjụọ, mmadụ puku abụọ na-eso m n'Instagram ma ugbu a ha eruola mmadụ puku iri. Ndị mmadụ na-ekwu zi okwu na ihe onyonyo ebe m yi mbeleukwu m ji agba egwu"" Ratri Anindyajati bidoro igosi njirimara ọrịa coronavirus nke mere ka ọ gaa kwa nnyocha. Mpụta nnyocha ya gosikwara na o butela ya bụ ọrịa Ntule Richard Mckay bụ Ọkammụta na onyenkụzị ihe gbasara mbido ọrịa zuru ụwa ọnụ Mckay kọwara na ịkpọ mmadụ ""Patient Zero"" maọbụ onye mbụ bu ụzọ bute ọrịa zuru ụwa ọnụ na-eduhe karị ndị mmadụ. O kwuru na a na-enwekarị ndị ga-ebu ya bụ ọrịa ma ọ gaghị egosi n'ahụ ha. Mckay kọwara na-ịkpọ mmadụ onye mbụ butere ọrịa dịka coronavirus na ebute kwa ịkpa oke na ịkwa emu. Ọ kọwa kwara na ọtụtụ mgbe, gọọmentị agaghị etinye ụchụ ị chọpụta ndị ọzọ bu ya bụ ọrịa a dika ha ga-etinye uche ha niile na ndị mbụ ha chọpụtara maọbụ ndị a na-akpọ ""Patient Zero"". Dịka ọ dị ugbua, Tyasutami, Anindyajati na nne ha bụ Darmaningish enwerela onwe ha. Ụfọdụ na-akọ ha ọnụ, akpọ ha ekwensu kama Anindyajati sị "" anyị kwetere na enwere ndị ọzọ bu ya bụ ọrịa ma ewepụ anyị, kama ma enweghị ihe ọzọ, nchọpụta nke anyi mere ka gọọmentị bido iluso coronavirus ọgụ"". Ụgbụ a,mba Indonesia enwela mmadụ puku iri na abụọ bu ọrịa coronavirus ebe mmadụ narị itolu anwụọla site n'aka ya bụ ọrịa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52559972 +politics NLC sị na ha ekweghị na ndọghachiazụ n'ụgwọ opekatampe "Otu jikọrọ ndị ọrụ bụ NLC n'aha ichafụ ekwuola na ha agaghị enye ohere ka enwe ndoghazi azụ n'imezu atụmatụ iwelite ụgwọ opekata mpe oge ekwuru na aga eme ya. Onyeisi ndị NLC bụ Ayuba Wabba kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi ndị ọtụ ahụ wepụtara na websait ha maka ncheta ụbọchị ndịọrụ, nke a kpọrọ May Day. Gọọmentị etiti kwere nkwa ibido imezu nkwekọrịta mwelite ụgwọ opekatampe ọhụ n'agba nke atọ nke afọ. Wabba bụ onye kwara arịrị na gọọmentị emezubeghị nkwa iwelite ụgwọ ọrụ opekatampe sị, ""Anyị ga-agbalị ịhụ na oge ahụ kọmitii maka imezu ụgwọ opekatampe ọhụrụ a ga-eme dịka esiri kwuo ya na enweghị mgbanwe ọbụla. ""E kwesiri ilekọta ndịọrụ bụ ndị na-akpata akụ dịka anyị mara ọnọdụ ndịọrụ Naịjirịa ọkachasị ka ihe siri ada oke ọnụ n'ahịa."" Ọ gara n'ihu kpọkuo gọọmentị etiti ka ha lebanye anya n'okwu ezi ọchịchị obodo, enweghị ọrụ nakwa ọganihu. Isi okwu ncheta ụbọchị ndị ọrụ nke afọ a bụ"" Ọrụ dịrị otu ndịọrụ na ọganihụ ala anyị, jikere maka ilụ ọgụ, jikere imeri."" Cheta n'abalị ole na ole gara aga, Wabba dọrọ ndị steeti gọọmenti na ndị ụlọọrụ na abụghị nke gọọmentị aka na ntị sị na NLC agaghị anabata okwu nkọwa ọbụla ga-ekwu na ha enweghị ike isonye na mmezu ụgwọ ọrụ opekatampe ma a malite ya." https://www.bbc.com/igbo/43959088 +politics Ipob and Nigerian Army: Ọ bụghị n'Orlu ka ogbunigwe gbara, ọ bụ na Lilu Mgbọ ndị ahụ mebisichara ụlọ m na Lilu dị n'Ezi-Orsu, n'Anambra steeti. https://www.bbc.com/igbo/afirika-56133444 +health HIV Cure: Agwọtala onye ọzọ bu ọrịa HIV "Otu nwoke na London aha ya bụ Adam Castillejo abụrụla onye nke abụọ a gwọtara ọrịa HIV n'ụwa niile. Ndị dọkịta chọpụtara na Castillejo enweghịzi nje HIV ka ọ gachara ọnwa 30 ọ kwụsịrị ịnara ọgwụgwọ maka ya. Ihe tụrụ n'anya bụ na ọbụghị ọgwụ HIV gwọrọ ya. Ihe gwọrọ ya bụ nke a kpọrọ 'stem-cell treatment' bụ nke ọ natara maka ọrịa cancer ọ rịaburu. Dịka akwụkwọ nnyocha the Lancet HIV si kwuo, e nwere ndị ahụ ha anaghị anabata nje HIV. Ọ bụ ndị dị otu a nyere Castillejo 'stem cells' ha nke mere ka ahụ ya kwụsịkwa ịnabata nje HIV. N'afọ 2011, Timothy Brown onye obodo Berlin na Jamanị bụ onye mbụ a chọpụtara na ọrịa HIV ya alaala. A hụghị nje ọrịa ahụ n'ahụ Brown ka ọ gachara afọ atọ na ọkara ọ kwụsịrị ịṅụ ọgwụ. Timothy Brown natakwara ọgwụgwọ 'stem cell treatment'. 'Stem-cell transplants' bụ usoro ọgwụgwọ pụrụ iche e ji agwọ ụfọdụ ọrịa siri ike dịka sickle cell, diabetes na ndị ọzọ. Ọ bụrụ na onye nyere mmadụ 'stem cells' ya nwere ọrịa ahụ ya anaghị anabata nke Bekee kpọrọ 'immunity', onye ahụ ga-enwetakwa 'immunity' ahụ. Ndị dọkịta na-ekwu na ọ dịka onye nyere Castillejo 'stem cells' ya nwere 'immunity' maka ọrịa HIV. Ọkammụta Ravindra Kumar Gupta, nke Mahadum Cambridge, gwara BBC na nke a pụtara n'ọrịa HIV alaala n'ahụ Castillejo kpam kpam. Gupta kwuru sị: ""O ruola afọ abụọ na ọkara ọṅụbeghị ọgwụ mana HIV anọghịzị n'ahụ ya."" ""Nchọpụta anyị goziri na 'stem-cell transplantation' nke gwọrọ HIV afọ itoolu gara aga nwere ike ime ọzọ."" Nnyocha na-ekwu na ọ ga-ara ahụ tupu HIV alaghachikwa n'ahụ Castillejo ọzọ. Mana onwebeghị onye ma nke ga-eme n'ọdinihu. Castillejo n'onwe ya kwuru na nke a bụ nnọọ ihe ịtụnanya. O kwuru sị: ""A chọrọ m ịbụ onye na-egosipụta olileanya."" ""Achọghị m ka ndị mmadụ na-ele m anya dịka onye pụrụ iche.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51825484 +business Nigeria to Dubai: Ihe na-akpọga ndị Naịjirịa Dubai "Dubai bụ ezigbo ọzara ihe dịka afọ 50 gara aga, mana ugbua ọ bụzị obodo ụwa niile na-eto maka ọganihu na mmepe obodo. Obodo a dị na mba United Arab Emirates (UAE), ebe ọ bụ isiobodo Dubai Emirates. Ọ bụ Sheikh Rashid bin Saeed Al Maktoum malitere ịchị Dubai n'afọ 1958 bụ onye malitere mmepe Dubai, mana mmanụ agbịdị achọtara n'obodo ahụ n'afọ 1966 nyerela ha ezigbo aka. Ego mmanụ agbịdi a banyere ọrụ were mee Dubai ihe ọ bụ ugbua. Onye na-anọchịte anya Dubai na Naịjirịa bụ Dọkịnta Fahad Al Taffaq, kwuru na ihe ruru mmadụ nde iri na ise (15m) na-aga obodo ha kwa afọ. Ọtụtụ n'ime ndị a na-aga Dubai bụ ndị Naịjiria. Mana gịnị ka ndị mmadụ na-achọ aga mba ahụ? Lee ihe ndị anyị chọpụtara na-akpọga ha. 1) Dubai na-anabata ndị mmadụ Al Taffaq sị na ọ bụ etu ndị obodo ahụ si anabata ndị Naịjirịa mere ha ji abịa ebe ahụ n'ike n'ike. Ọ sị na ihe ruru ndị si mba 200 bi na Dubai na-akpọ ya be ha nke abụọ. Dubai bụ ebe e si aga mba dị iche iche. Taata, Dubai bụ ihe Bekee na-akpọ ""hub"" e si aga Chaịna, Indịa, na mba dị iche iche. Al Taffaq sị; ""Anyị na-akpaso ndị mmadụ agwa ka ha abụ mmadụ, agbanyeghị ebe ha si bịa na ofufe ha. Ihe a bụ etu anyị dị."" 2) Dubai bụ nnukwu ahịa Na Dubai, ịzụ ahịa bụ ihe dịrị ndị mmadụ mfe. Onye ọbụla chọrọ ịzụ ahịa ga-ahụrịrị ebe ọ ga-anọ zụọ ya n'obodo ahụ. Ọtụtụ ndị na-aga ebe ahụ na-ekwu na ngwaahịa adịghị ada oke ọnụ ebe ahụ. Ọzọkwa bụ na ha na-emekarị ihe Bekee na-akpọ ""sales"". Nke a bụ oge ndị na-azụ ahịa na-ewetu ego ngwaahịa iji mee ka ọtụtụ mmadu bịa goro ha. Gọọmentị Dubai na-emekwa ihe niile ha nwereike ime iji hụ na azụmahịa na-aga etu o si kwesi. 3) Dubai bụ ebe a na-aga nlegharị anya Dubai mepere ọfụma nke mere ọtụtụ mmadụ ji na-abịa ya ime nleghari anya. Ụfọdụ ji maka ya ekwu sị ""ebe obodo a mara ụdịrị mma a, kedụ ka eluigwe ga-adị"". Ụlọ kachasị ogologo n'ụwa dị na Dubai. Ha chọkwara obodo ahụ mma nke ukwu ma na-edowe ya ọcha. Nke nwereike na-amasị ndị Naịjirịa bụ na ọkụ latrik na-enwu ebe ahụ gbanyụụ. 4) Ndị Dubai ji ihe ha nwere kpọrọ ihe Dubai nwere ọzara, ebe ihe ọbụla anaghị eto. Ebe ahụ bụ sọsọ aja dị ya, nke Bekee na-akpọ ""desert"". Ha ji ebe ahụ mere ebe ndị mmadụ na-aga eme nlegharị anya nakwa eme egwuregwu, bụ nke ha na-akpọ 'desert safari'. Ha nwekwara ụdịrị ebe Bekee kpọrọ ""Beach"" ha na-edowe ọcha ma na-arụzi ya na-eme ka ịnọ na ha na-agụ ndị mmadu agụụ. Naịjirịa nwekwara ụdịrị ihe ndị a mana ha anaghị edowe ha ọcha maọbụ hazie ha etu o si kwesị. 5) Ihe eji egwuregwu bụ atụrụ tawa n'obodo a I chọrọ isi n'elu ụgbọelu mapụ? Ị chọrọ isi n'elu ụlọ elu mapụ? Ị chọrọ igwu mmiri n'ime osimiri maọbu rahụ n'ụlọ dị n'okpuru mmiri? Dubai nwere ebe a na-eme ọtụtụ ihe ndị a niile na ndi ọzọ dị etu ndi kachasị mma n'ụwa dị. Etu eji achụla ndị mmadụ na Dubai Na-agbanyeghi na Dubai na-anabata ndị mmadụ, ha na-agbarụkwa ihu ma mmadụ merụọ iwu ha. Onye merụrụ iwu ha nwereike hụ onwe ya n'ụzọ nlata. Lee iwu abụọ Dubai nwereike iji chụla mmadụ: 1) Iwu ụlọikpe: Nke a na-efesa ndị dara iwu nwetere ikike ya n'usoro ụlọikpe Bekee kpọrọ ""Legal Deportation"". Dịka iwu UAE siri kwuo, usoro a na-adị ire n'ihe banyere mwakpo mmadụ n'ụdịrị mmetụ ahụ. 2) Iwu gọọmentị: Nke a metụtara ịchụla mmadụ makana ọ bu ihe obodo chọrọ. Ihe nwereike ibute nke a bụ ihe metụtara ahụike obodo, nchekwa nakwa ime arụ. Ndị mbịarambịara na-enweghi ihe ha na-arụ na Dubai nwekwara ike hụ onwe ha n'ụdịrị ọnọdụ ndị agbara akwụkwọ ụla a. Ndi UAE chụo gị, ịlaghachịte mba ahụ ga-ara gị ezigbote ahụ. Ọ bụ nanị Minista na-ahụ maka obodo ga-enyenwu gị ikike ị ga-eji batakwa ọzọ. Gaa ebe a ka ị nwete akụko ndị ọzọ banyere ọchụchụ mmadụ na mba a." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50463491 +sports Ndubuisi Egbo: Anaghi m aga Champions League igwu egwu Ndubuisi Emmanuel Egbo gbaara Naịjirịa bọọlụ n'otu Super Eagles, mana ihe aha ya ji ada ụda ugbua bụ na ọ bụrụla onye Afrịka mbụ du otu egwuregwu bọọlụ Yurop aga asọmpi Champions League. Otu bọọlụ Maazị Egbo na-akụziri bụ k.T. Tirana, emeela ka ndị otu ya soro na ndị ga-achịpụya na Champions League nke afọ 2020/2021. Na mkparịtaụka a, ọ gwara BBC Igbo etu o si akwado asọmpi ahụ nakwa usoro ọ na-ele anya ga-enyere ya aka iburu iko Champions League ahụ. Gee ya ntị n'uju. Ndị mere akụkọ a bụ Jessica Nwankwo na Chiemela Mgbeahuru. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-53620520 +health China Coronavirus: Anyị ebidola inyocha ndị njem - FAAN "Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naijiria bụ 'Federal Airports Authority of Nigeria' (FAAN) arịọla ụmụ Naijiria na-eme njem ka ha rube isi ma nye ohere maka inyocha ha ahụ. Nke a na-eme dịka ajọ ọrịa Coronarvirus dapụtara na China, gbuo mmadụ iri abụọ na ise ma jituo ihe karịrị mmadụ 300. Ọrịa ahụ efesakwaala ruo mba Japan,Thailand, Singapore nakwa South Korea. N'akwụkwọ ozi ya, ọnụ na-ekwuru FAAN bụ Henrietta Yakubu kwuru na ụlọrụ ahụ na ngalaba na-ahụ maka ahụike agbaala mbọ iji hụ na ngwa ọrụ dị mkpa iji gbochie ọrịa ahụ zuru oke n'ọdọụgbọelu. O kwuru sị: ""Ngwa ọrụ nile na ndị ọrụ ndị nyere aka na ịkwụsị ọrịa ebola n'afọ 2014 ka dịkwa n'ọdọụgbọelụ anyị."" Ka ọ dị ugbua, ọrịa coronavirụs emeela ka e mechie obodo mepere emepe atọ na China; Wuhan, Ezhou na Huanggang . Obodo Beijing kwụsịkwara mmemme niile ha chọpuburu ime n'ihi ya bụ ọrịa. Iba Lasa aribatala n'Enugwu steeti. Onye ntaakụkọ BBC gara ụlọọgwụ Parklane ebe ndị ọrụ nọ na gbagharia dịka orịa lassa Fever gburu otu nwaanyị gbara afọ iri asaa na ise ebe ahụ. Ka ọ dị ugbua, enwetela mkpesa Lassa fever na Ondo,Abia, Delta na Kano steeti. ọrịa a egbuola dọkinta abụọ na nwaanyị dị ime na Kano, mmadụ iri na isii na Ondo steeti, otu nwoke n'Abia steeti. Ka akụkọ nje na ọrịa na-aga n'ihu, ndị mba China amachiela mbata ma ọ bụ ọpụpụ na obodo Wuhan maka nje Corona nke na-egbu ndị mmadụ ka ọrịa SARS. Nyocha na egosi na ọ bụ na Wuhan ka ya bụ nje siri bido site na-ire anụ ọhia. Mmadụ iri na asaa anwụọla ebe ihe dịka mmadụ narị ise na iri asaa bụ ya bụ ọria ma otutu ha bị na Wuhan. Mmadụ atọ anwụọla dịka ụgbọelu eji emenyu ọku dara na mba Ọstrelịa. Mmadụ atọ a bụ ndị mba Amerịka sọ na mmadụ iri ato na atọ nwurula maka ọku a bidoro gbawa kamgbe ọnwa Seputemba 2019. Dịka ọ dị ụgbụa, amabeghị ihe mere ka ya bụ ụgbọelu daa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51225156 +politics Joe Biden Inauguration: Onye bụ Joe Biden bụ onyeisiala ọhụrụ mba Amerịka? Ihe niile ị kwesiri ịma maka etu Joe Biden siri bido njem ị bụ onyeisiala mba Amerịka. https://www.bbc.com/igbo/afirika-55726297 +health High blood pressure: Ị ma na onye ọ na-eme n'afọ 30 na 40 nwere ike imecha nwee nsogbu n'ụbụrụ? "Ndị rurula afọ 30 kwesịrị ịgba mbọ hụ na ha enweghi ọbara mgbali elu iji gbochie ọrịa ụbụrụ mgbe ha kawara nka, dịka nchọpụta si kwuo. Nchọpụta ahụ kọwara na ""oge kacha mkpa"" iji echekwa ahụike ụbụrụ mmadụ bụ site n'oge ahụ ruo mgbe mmadụ karuru mbido afọ 50. Nchọpụta ahụ so mmadụ 500 a mụrụ n'afọ 1946, gosiputara na ọbara mgbali elu mere mmadụ na mbido ""etiti ndụ ya"" nwereike ibute ọrịa ụbụrụ. Nke a abụghị mbụ a na-eche na ọbara mgbalie elu bidoro n'oge nwereike ibute ọrịa ụbụrụ nke na-eme ka mmadụ na-echefukarị ihe, nke Bekee kpọrọ ""Dementia"", mana ndị ọkammụta sayensị chọrọ ịghọtakwu mgbe nakwa etu o nwereike ime. N'ime oge e mere nchọpụta a nke e biputara n'ọbaozi Lancet Neurology, e nyochara ndị sonyere na ya iji mata ogogo ọbara ha ma nyochakwa ụbụrụ isi ha. A chọpụtara na ọbara mgbali elu mere onye dị ebe afọ 36 ruo afọ 43 butere mpewanye mpe ụbụrụ. 'Iweta mmebi ọsịsọ' Ụbụrụ onye ọbụla na-atalatu obere ka onye na-aka nka, mana ọ na-egosikarị ọfụma na nke ndị na-arịa ọrịa ndị dịka ọkpọnụbụrụ nke Bekee kpọrọ ""Dementia"" bụ ọnọdụ ichefu ihe na-abịakarị n'agadị. Ebe ndị e nyochara egosighi na uche ha ezuchaghị ezu, ndị nnyocha kwuru na ọtịta ụbụrụ na-amalite tupu nke ahụ - nke bụ na ha ga-aga n'ihu na-etinye anya ebe ndị ha nyochara nọ n'afọ ndị na-abịa, iji mara ma ọ ga-emecha mee ha. A chọpụtara na ọbara mgbali elu na-eme ndị dị afọ 43 ruo afọ 53, butere mmebi okporo ọbara na-agba n'ahụ maọbụ ""obere mkpọnwụ ahụ"" oge ndị mmadụ ruwere ebe afọ 70. Ọkammụta Jonathan Schott, onye ọrụ ya bụ inyocha ụbụrụ isi mmadụ na UCL Queen Square Institute of Neurology, du ndị mere nnyocha a. O kwuru sị ""Ọbara mgbali elu, ọbụladị oge anyị dị afọ 30, nwereike inye ụbụrụ mmadụ nsogbu mgbe afọ iri anọ gachara. Nnyocha na mgbochi e ji elekọta ahụike ụbụrụ mgbe onye kawara nka, kwesịrị ịmalite ebe etiti ndụ mmadụ."" Paul Leeson, onye bụ ọkammụta n'ihe gbasara nlekọta ọrịa obi na mahadum Oxford, kwuru: ""O teela anyị matara na ụfọdụ ndị nwere ọbara mgbali elu na-emecha nwee mgbanwe n'etu ụbụrụ ha dị. ""Ihe ndị dọkịta na-arụrịtaụka maka ya kemgbe bụ ma ilekọta ọbara mgbali elu n'ahụ ndị ntoroobịa ọ na-egbochi mgbanwe ụbụrụ ndị a. ""Ihe ọzọ a ga-emenwu bụ nke anyị na-emekarị ugbua, bụ ichere ruo mgbe onye kataturu obere, ibido na-enyocha ọbara mgbalie elu makana anyị ma na mgbe ahụ, mgbanwe ụbụrụ isi amalitela n'ike n'ike."" Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49442911 +entertainment African Michael Jackson: Oyiyi m yiri Michael Jackson mere ka m gbawa egwu ka ya Chdiebere Egeko bụ onye na-agba egwu bi n'Enugwu eji ịgba egwu ja oti egwu Michael Jacksom mara. Dịka o siri kwuo, etu o siri yie Michael Jackson nakwa etu o siri na-agba egwu ka ya nyere ya ohere isonye na ejijie Nollywood dịka Michael Jackson. N'ihe onyonyo a ọ na-akọwa etu o siri na-agba mgbọ ịhụ na o yiri Michael Jackson ọfụma nakwa etu ndị mmadụ anabata ihe ọ na-eme. Gee ya ntị n'uju. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Mgbeahuru na Chukwunaeme Obiejesi. https://www.bbc.com/igbo/afirika-57757139 +health Coronavirus Tips: Ọbụghị eziokwu na ndị ntorobịa enweghị ike ibute ọrịa coronavirus Ọtụtụ na ekwu na coronavirus bụ ọrịa ndị okenye, nke na ndị ntorobịa ọbara ha dị ọkụ agaghị ebute ya. Onye gwara gị? Coronavirus egbuola ma ndị okenye, ma ndị ntorobịa, ma nwata a mụrụ ọhụrụ. Ya mere ụzọ kacha mma bụ ichekwa onwe gi. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Chimezie Ucheagbo na Chiemela Mgbeahuru Peter https://www.bbc.com/igbo/afirika-52237203 +entertainment "Regina Daniels: ""A maghị m ihe ndị mmadụ ji akọrọ m ọnụ""" Regina Daniels bụ onye na-eme ihe nkiri Nollywood ama ama ekwuola maka etu imụta nwa si gbanwe ndụ ya. O kwukwara ihe mere ọtụtụ ndị ntoroọbịa Igbo anaghị amụta Igbo n'oge. Gere ihe ndị ọzọ o kwuru ihe mere o ji belata aka n'ịnara agwa ugbua n'ihe nkiri Nollywood ugbua. Ọrụ a si n'aka Nnamdi Agbanelo na Jessica Nwankwo https://www.bbc.com/igbo/afirika-58220571 +business Twitter Ban: Otu ọkaiwu akpụpụla gọọmentị Naịjirịa ụlọikpe maka mmachi Twitter Otu onye ọkaiwu aha ya bụ Inibehe Effiong akpụpụla Lai Mohammed, Abubakar Malami na Gọọmentị etiti ụlọikpe ukwu dị na Legọs maka ịmachi Twitter. Effiong sị ma mmachị ahụ megidere ikike dịrị onye dịka e dere ya n'iwu Naijiria nke afọ 1999. Effiong gwara ụlọikpe ka o kpebie na ihe Malami na Mohammed sị na a ga-atụ onye daara iwu mmachi Twitter na okwu na-ezighi ezi makana ọ dịghị n'akwụkwọ iwu Naịjirịa. Twitter bụ ngwa ọrụ Ipob ji agbasakarị ozi ha - Lai Mohammed Lai Mohammed bụ Minista na-ahụ mgbasaozi na Naịjrịa akụwarala BBC akụoyibo Nsugbe gbasara mmachị gọọmentị Naijiria machiri Twitter. O kwuru na Twitter bụ ngwaọrụ otu Ipob na otu ndị ọzọ ji agbasakarị ozi ha. O kọwakwara ihe Gọọmentị Etiti bu n'uche n'ozi ahụ ha ziputere bụ nke Twitter wepụrụ. Gee ihe o kwuru n'uju ebe a: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-57404198 +business Fake bank alert: Ihe ise ị ga-eji amata 'bank alert' adịgboroja "Ndị oji intanet ezu amapụtala ụzọ ọhụrụ iji na-apụ ndị mmadụ ego ha site n'ịzụ ihe ma zigara onye ha zụrụ ahịa ozi ụlọakụ abụghị nke ọma na-egosi na ha kwụọla ụgwọ ihe ha zụrụ. N'ọnwa ole na ole gara aga, ndị uweojii nwuchiri onye dọkịta ghọrọ oji ịntanet ezu, nke jirila ụzọ aghụghọ zụrụ ọtụtụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ dị oke ọnụ aha n'ịntanet. Chidi Udeogu na Innocent Orji bụ ndị 'software' inginịa n'ụlọọrụ 'Zedcrest Capital' bụ ụlọọrụ na-ahụ maka ịhazi akụnaụba kọwara ụzọ ole na elo ị ga-eji mara ma gbalahụ ozi ụlọakụ adịgboroja. 1. 'Bank alert' adịgboroja na-egosi naanị ego ole a kwụnyere, ebe ozi si n'ụlọakụ gị n'ezie ga-egosi ego ole fọrọ n'akpaego dị n'ụlọakụ. 2. Ọ bụrụ na edemede ozi i nwetara dị iche na nke ị na-enwetabu. Orji kọwara na ozi ""Ndị nke adịgboroja, na-etinye kpọm, rịkọm maọbụ 'underscore' n'aha ụlọakụ na-ezite ozi ahụ, nke a na-ede ya n'obere mkpụrụedemede (small letter)."" 3. Ezigbo ozi na-egosi akara anọ ikpeazụ dị n'akara akpaego gị (account number), mana nke adịgboroja anaghị ebu ya. 4. Ezigbo ozi ga-akọwa ihe ego ahụ bụ ma ọ bụ mwepụ ka ọ bụ mgbakwụnye nyere ihe dị n'akpaego gị n'ụzọ kwesiri ekwesi. 5. Were 'banking app' mara ego ole banyere n'akpaego gị n'ụlọ akụ. Ọ bụrụ na obi akaghị gị, ọ kachasị ma mmadụ zụọ gị ahịa dara oke ọnụ ahịa, Udeogu na Orji dụrụ ọdụ ka i jiri 'bankịng app' dị n'ekwentị gị lee akpaego gị n'ụlọakụ tupu ị hapụ onye zụrụ gị ahịa ka ọ lawa. Udeọgụ kwuru ka ị ""kpọọ 'Account officer' gị ma 'bank alert' gị edoghị gị anya,"" maka ndị ụta." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49269765 +politics Olusegun Obasanjo: Ihe isii mere ndị Igbo ejighi echefu Obasanjo "Aha ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa kpụ n'ọnụ taa bụ Olusegun Obasanjo bụ aka chịburu Naijiria malite n'afọ 1999 ruo 2007. Nke a bụ maka na taa bụ abalị ise nke ọnwa Maachị ka ọ gbara afọ iri asatọ na atọ. Ụfọdụ na-ekwu na Obasanjo bu dike, ebe ndị ọzọ na-ekwu na o meghị ọfụma. Lee ihe ụfọdụ mere ọtụtụ ndị mmadụ, ọkachasị ndị Igbo ga-eji na-echeta Obasanjọ oge ọbụla. N'afọ 1976, oge onyeagha aha ya bụ Dimka gburu onyeisiala oge ahụ bụ Murtala Mohammed, a họpụtara Obasanjo ka ọ bụrụ onyeisiala. Mana ka afọ atọ gachara, n'afọ 1979, Obasanjo haziri ntuliaka ma were ọchịchị hafee n'aka ndị nkịtị. Nke a nyere ya ihu ọma n'akụkụ ụwa niile. 2) Ọbịbịa nke abụọ Ọbasanjọ bụ onye mbụ debara aha ya n'akwụkwọ akụkọ dịka onye mbụ chịrị Naịjirịa ugboro abụọ, dịka onyeagha na dịka onye nkịtị. Ọbịbịa nke abụọ ya pụrụ iche n'ihi na Onyeisiala oge ahụ bụ Sani Abacha mara ya ikpe ọnwụ ma tụọ ya mkpọrọ. Ọ bụ na mkpọrọ ahụ ka o si pụta oge Abacha nwụchara, zọọ ọkwa onyeisiala ma merie. 3) Itinye ndị ma ihe ha na-eme n'ọkwa dị elu Ọtụtụ gbara ama na ọchịchị Obasanjo bụ oge ndị ma ihe ekwe na-akụ nọ n'ọkwa kwesịrị ha na Naịjirịa. Chidi Lemchi, onye ọkachamara n'okwu akụnaụba, kwuru na Obasanjo tinyere ndị kwesịrị ekwesị n'ọkwa. Lemchi kwuru sị: ""Ndị dịka Ngozi Okonjo-Iweala, Oby Ezekwesili, Charles Soludo, Ojo Maduekwe, na ndị ọzọ, bụ Obasanjo nyere ha ọkwa n'oge ahụ."" ""Obasanjo achọghị ịma mpaghara onye si na ya pụta, onye ọbụla ma ọrụ ka ọ na-enye ọrụ ahụ."" 4) Ụlọọrụ gbara ọkpụrụkpụ o hibere Lemchi kwukwara na ọ bụ Obasanjo hibere ụlọọrụ dị icheiche gbara ọkpụrụkpụ ndị ka dịkwa ire ruo taa. ""Ọ bụ Obasanjo hibere NHIS (National Health Insurance Scheme, ya webatara ekwentị, ya hibere EFCC na ICPC."" Ọ bụkwa Obasanjo hibere atụmatụ 'Sovereign wealth fund' nke mere Naịjirịa ji malite idopu ego maka ọdịnihu. Mana ọ bụghị sọ mma mma ka e ji echeta Obasanjo, ọ nwegara ụkwụ ọ kpọrọ nyere ya ajọ aha ebe ndị ụfọdụ nọ. Ha gụnyere: 5 ) Agha Biafra Obasanjo so n'otu n'ime ndị isi agha Naịjirịa n'oge a lụrụ agha Biafra. Dịka ọkammụta Ugoji Egbujo si kwuo, Ọbasanjo so na ndị kacha mekpaa Bịafra ahụ n'oge agha. Ọkammụta Ugoji Egbujo kwuru na ọ bụ eziokwu na Obasanjo hụrụ Naịjirịa n'anya, mana mpako ya bụ ihe metọrọ ihe niile o mere. Egbujo kwuru na ""Obasanjo chọrọ ịchị Naịjirịa ruo ụwatụwa"". Cheta na mgbe ọchịchị Obasanjo chọrọ ịbịa n'isi njedebe, ọ malitere ịkpa nkata etu ọ ga-esi chikwuo afọ anọ ọzọ ije mezuo ọchịchị ya afọ iri na abụọ. Nke a ka a kpọrọ 'third term agenda' na bekee. Mana ọtụtụ ndị ụlọ omeiwu ukwu gbadoro ụkwụ n'ala, jụwaa isi na ya bụ ihe agaghị enwe isi. Na-agbanyeghi ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na Olusegun Obasanjo abụghị obere mmadụ, ma na Naịjirịa ma na mba ụwa. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51757853 +politics ‘Kemgbe 1999 enwebeghi onye kpalitere mmụọ ndị mmadụ ka Peter Obi’ – Shehu Sani "Sinetọ Shehu Sani etinyela ọnụ n'okwu gbasara ndị Alakụba abụọ (Muslim-Muslim tiketị) nke pati All Progressives Congress (APC) ji azọ ọkwa onyeisiala. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Sani kwuru na iwu obodo Naịjiria amachighi ndị ndọrọndọrọ isi n'okwukwe ọbụla masịrị ha họrọ onye ha chọrọ ka ọ nọchite ha n'ọkwa ntuliaka ọbụla. Mana ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ n'ihi ụdịrị ọnọdụ Naịjiria nọ n'ime ya mere o ji bụrụ ihe kwesịrị ekwesị na ndị pati ndọrọndọrọ ga-ahọrọ mmadụ abụọ na-anọchi ofufe abụọ dị iche (dịka nke Alakụba na nke okpukpere Kraịst). Sani kwuru na ọ bụrụ na ya bụ 'Muslim-Muslim' tiketị ndị APC ji azọ ọkwa were gị iwe, na ọ dị mkpa igosi iwe ahụ site n'ịtụnyere pati ndị ọzọ na-ejighi ndị Alakụba abụọ azọ ya bụ ọkwa onyeisiala, ""karịa ị na-ebe akwa arịrị maka ya"". Ọ gara n'ihu kwuo na ọ dị ka imeri ntuliaka afọ 2023 ka pati APC mkpa karịa ime ihe ha kwesịrị ime iji medaa ndị mmadụ obi n'ihi nkewa dị n'obodo. O kwuru na otu ihe o che mere ndị mmadụ ji na-ewe iwe maka APC ịhọpụta ndị Alakụba abụọ bụ maka na ọ bụ ha bụ pati nọ n'ọchịchị ugbua. O kwukwara na iwe ha bụ maka na ọ dara nkwekọrịta ha nwere maka ịhọpụta ndị nwere ofufe dị iche iche. Gbasara nkatọ a na-akatọ Peter Obi bụ onye ji ọkọlọtọ Labour Party azọ ọkwa onyeisiala na soshal midia, o kwuru sị na ọ bụ n'ihi na soshal midia abụrụla ngwaagha e ji alụ agha n'oge ugbua. O kwuru na ndị pati ndị ọzọ enweela ebe ha gbadoro ụkwụ na mgbọrọgwụ, mana ọ bụ ndị ntorobịa ugbua (bụ ndị juru na soshal midia), bụ ebe mgbọrọgwụ nke Obi dị, na ọ bụ nke a mere ndị pati ndị ọzọ ji achọ isi n'ebe ahụ ọ gbara mgbọrọgwụ nweta ya. Ọ kọwara etu o si bụrụ Peter Obi mere ka ọ hapụ pati APC sonye Peoples Democratic Party (PDP), mana ka ọ na-abata ka Obi na-ahapụ PDP na-esonye pati Labour. Gee ihe ndị o kwuru n'uju n'ihe onyonyo a." https://www.bbc.com/igbo/articles/cw83qj5lwlxo +religion "Nigerian Pastors: ""A kpaa gị ị pụọ n'ụzọ"" na okwu ndị ọzọ e ji mara ndị ụkọchukwu" "Ọtụtụ oge ka ndị ụkọchukwu na Naịjirịa na-ekwu okwu na-eme ka ebe niile nwuru ọkụ. Mana ọtụtụ n'ime ha bụ ndị e ji okwu dị aṅaa mara, nke bụ na ebe ọbụla ị nọ nụ olu ha nakwa okwu ha, ị mara onye kwuru ya. Ụfọdụ ndị ụkọchukwu bụ ndị malitere iwu ewu n'ihi ihe ha kwuru, ebe ndị ọzọ na-ekwu ihe ha na-ekwu iji mee ka ndị mmadụ jiri ya mara ha nke Bekee kpọrọ Trademark. 1) Enoch A. Adeboye: Nwanne ị bụzịkwa onye Naịjirịa ma ọ bụrụ na ị maghị onye na-ekwu ""Let somebody shout Hallelujah"" ka ọ bụzị ""Say that amen louder""? Adeboye rigohaala n'elu ọlta, otu n'ime ihe mbụ ọ na-ekwukwarị bụ ka ndị mmadụ tie mkpu Hallelujah; nke a emeela ka onye ọbụla mara na ọ bụ ya na-ekwu okwu. Adeboye bụ onyeisi ụlọụka Redeemed Christian Church of God nke a na-akpọ RCCG n'ịchafụ. 2) David Oyedepo: Ị ga-ama na ị nọ na Winners Chapel mgbe ị nụrụ ""Good news! The Lord has done it again"". Ọ na-ekwukwarị nke a ma e nwee nkwuputa ọkachasị nke gbasara ihe iribeama. Oyedepo bụ onyeisi Living Faith Church nke e ji Winners Chapel mara. 3) Temitope B Joshua (T.B Joshua): Ị chọrọ ịma ma ọ bụkwa olu ya ka ị na-anụ, tinye ihe onyonyo gị n'ebe a kpọrọ Emmanuel TV. Ebe ahụ ka ị ga-ama ma ọ bụ T.B Joshua na-ekwu okwu mgbe ị ga-anụ ""touch your screen"" nakwa ""Emmanuel""! Onye amụma Joshua bụ onyeisi ụlọụka Synagogue Church Of All Nations. 4) Chukwuemeka Ohanaemere: Ị bụrụ nwaafọ Naịjirịa ọkachasị onye Igbo, ị gaara anụla maka onye a na-akpọ Odumejeje maọbụ ""Liquid Metal"", ""The Lion Himself"". Ohanaemere ekwuola ọtụtụ ihe e ji echeta ya; gụnyere ""Onye battery ya fọrọ one bar ọ na-agba game?"", ""Anaghị akpọ ọga n'express"", ""Onye gba ọtọ a na-etinye aka n'akpa?"", ""A na-ahụ ọka na filling station?"" nakwa ""A kpaa gị ị pụọ n'ụzọ ka a kpaa onye ọzọ"". Ọ bụ onyeisi ụka Mountain Of Holy Ghost Intervention And Deliverance Ministry. 5) Ejike Mbaka: Fada Mbaka ekwuola ọtụtụ okwu mụnyere ọkụ ma kpalite ndọrịtaụka n'etiti ndị Naijiria ọtụtụ oge. Mana ndị nke kacha bụrụ njirimara ya ọ ga-abụ ị nụ ya ị mara na ị garuola ebe ọ nọ bụ ""Tem tem for Jesus"", ""Ụmụ ikuku eh"" nakwa ""Onye eze ibe m"". Mbaka bụ onyeisi Adoration Ministries dị n'Enugwu steeti. 6) Chris Oyakhilome: Oyakhilome so na ndị ụkọchukwu ụlọụka ha dị na mpaghara ụwa dị iche iche. Okwu e ji mara ya gụnyere ""So mightily grew the word of God and prevailed"", Ọ bụ onyeisi ụlọụka Believers' Loveworld nke e ji Christ Embassy mara. 7) David Ogbueli: Ogbueli so na ụkọchukwu ndị anaghị ""enyekarị nsogbu"" na Naịjirịa, mana o so na ndị ụlọụka ha buru ibu ma dịrị na mpaghara Naịjirịa dị iche iche. Okwu ndị e ji mara ya gụnyere ""Let them have dominion"", ""how do you create someting out of nothing"" nakwa ""God's principles never change"". Ọ bụ onyeisi ụlọụka Dominion City Worldwide. Kedụ nke ụkọchukwu ụlọụka gị na-ekwukarị? Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51592336 +business Enugu meat suspension: Ndị na-ere azụ na-achị ka ọdọ anụ Enugwu tọgbọ chakoo "Iji rube isi n'iwu ndị Miyetti Allah tinyere, o nweghị ebe e gburu anụ ma ọ bụ ree anụ n'ahịa niile dị n'Enugwu steeti taa ụbọchị 14 Ọgọst, 2019. Mgbe BBC rutere n'ahịa 'Old Artisan' na New Haven, Enugwu, ọdụ ebe a na-egbu ma na-ere anụ anụ tọgbọọ chakoo. Ọtụtụ ndị na-ere anụ nọ n'ọdụ ahịa ha ma ha anaghị ere ihe ọbụla. Ha kwupụtara obi ha na mgbachi a gbachiri ọdụ ahịa ha na etu o si metụta ha. Ha kwuru na agbanyeghị na o metụtara azụmaahịa ha kama na ọ bụ ihe banyere nchekwa ndụ na akụnaụba n'Enugwu Steeti. Benjamin Nnamani bụ onyeisi ndị na-egbu anụ kwuru na ha kwadoro nzuko gọọmentị na ndị Miyetti Allah bụ nke mere e ji gbachie ahịa ha. Otu nwaanyị bụ Oriakụ Ude bịara ịzụ anụ kwuru na obi adịghị ya mma na ọ hụghị anụ ọ ga-azụ. Cheta na ndị isi ahịa n'Enugwu esorola nzọmụkwụ otu Miyetti Allah n'ịmachi ogbugbu anụ ọbụla n'abalị abụọ. Abalị abụọ ahụ bụ ụbọchị 14 na 15 n'ọnwa ọgọst ebe ndị Miyetti Allah manyere ndị otu ha ọzụzụ nchekwa. N'ime akwụkwọ ozi nke BBC bitere aka, ndị isi ahịa machiri ""ogbugbu na ọzụzụ anụ ehi ọbụla"" ""Anyị na-agwa ndị otu anyị na a ga-agbachi ụlọ anụ onye ọbụla dara iwu a ebighebi"" ka akwụkwọ ozi ahụ kwuru." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49348942 +business Igbo Markets: Etu e si nweta aha ahịa anọ dị n'ala Igbo "Ahịa bụ ebe ndị mmadụ na-aga ere ihe ha nwere ma zụrụkwa ihe dị ha mkpa. N'ala Igbo, ahịa nwere mpụtara dị oke mkpa n'ihi na e kwenyere na ma mmadụ ma mmụọ na-agbakọ n'ọgbọ ahịa. N'ọtụtụ ebe n'ala Igbo, ọgbọ ahịa bụkwa ebe a na-anọ eme emume dị icheiche n'obodo, dịka ịgba mmọnwụ maọbụ ịgbapụta egwu, dgz. Aha ahịa e nwere n'ala Igbo bụ Eke, Orie, Afọ na Nkwọ. Dịka Mazị Chiagozie Nnabuihe, onye ọkammụta asụsụ na omenala Igbo na mahadum Legọs si kwuo, nke a malitere kemgbe e kere ụwa. Ọ kọwara na aha ahịa anọ ndị a bụ aha chi anọ nke Chukwu okike nyere ikike ilekọta ọwụwa anyanwụ, ọdịda anyanwụ, ugwu nakwa ndịda. Ọ kọrọ sị: ""Chukwu kere ụwa ebe ọ dị okirikiri, o wee zie anyanwụ ka o si n'aka nri na-aga njem ileta etu ihe siri dị n'ụwa ruo n'aka ekpe."" ""Nke a mere e ji nwee ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ."" ""Chukwu zikwara ọnwa ka o si n'ihu maọbụ n'ugwu na-aga njem ruo na ndagwurugwu maọbụ ndịda."" ""Nke a kewara ụwa ụzọ anọ nke kpatara Igbo ji nwee ahịa anọ na-anọchịte akụkụ anọ nke ụwa."" BBC Igbo kpọtụkwara ọka nkuzi Nkechi Nwokoye, onye bụkwa onye nkuzi asụsụ na ọdịnala Igbo na mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka. Nwokoye kwuru na ahịa ọbụla nwere chi ọ bụ. O kwuru sị: ""Eke, Orie, Afọ, Nkwọ, ha niile bụcha arụsị nke nnanna anyị ha na-efe n'oge gboo."" ""Nke ọbụla n'ime ha nwere ihe ọ bụ. Aha ọbụla n'ime ha nwere ihe ọ pụtara."" ""Mana o nweghi onye ma ihe e jiri baa ha aha ndị ahụ maọbụ mpụtara aha ndị a."" Nnabuihe kọwara na ndị Igbo kwenyere na mmadụ na-adị ndụ naanị abalị anọ: Eke, Orie, Afọ na Nkwọ. O kwuru sị: ""Afọ, ọnwa nakwa izu ndị Igbo bụ naanị abalị anọ"" ""Ị nọrọgodi ndụ ruo otu puku afọ, ọ bụ naanị abalị anọ."" ""Nke ị nọghị n'eke, ị nọrọ ya n'orie, nke ị nọghị n'orie, ị nọrọ ya n'afọ, nke ị nọghị n'afọ, ị nọrọ ya na nkwọ."" A na-ejikwa aha ahịa agụ mmadụ aha. Aha ndị a gụnyere Okeke, Okorie maọbụ Okoye, Okafọ, Okonkwọ, Nweke, Nworie maọbụ Nwoye, Nwafọ, nakwa Nwankwọ. Nke ụmụnwanyị bụ Mgbeke, Mgborie, Mgbafọ, na Mgbankwọ maọbụ Mgbọkwọ. Tupu e hibe ahịa ọbụla n'ala Igbo a ga-achụ aja. Nnabuihe kwuru na ọ na-abụkarị isi mmadụ ka a na-eji achụ aja dị otu a. Mana ọ ga-abụ isi 'onye ara', ọ bụghị onye ahụ zuru oke. ""Nke ahụ kpatara na mmadụ rịawa ara, ma o rubeghi n'ahịa tụtụrụ ihe, a ka nwere ike ịgwọta ya. ""Mana onye ahụ ruo n'ahịa tụtụrụ ihe maọbụ rahụ ụra ebe ahụ, ara ahụ agaghịzi enwe ngwọta."" Ahịa ọbụla n'oge gboo na-enwe ukwu osisi dị na ya. Ọ bụ n'ukwu osisi ahụ ka a nọrọ chụọ aja e ji hibe ya bụ ahịa. Osisi ahụ bụkwa ihe ịgba ama na e hibere ahịa ebe ahụ, dịka Nnabuihe siri kwuo. Mgbe gboo, mgbe elu bụ ala ọsa, anaghị eji ego azụ ahịa. Ihe a na-eme na ahịa oge ahụ bụ 'mgbanwe' maọbụ 'weta isi bịa were isi'. Onye nwere ji ga-abịa gbanwere ede, ebe onye nwere anụ ga-abịa gbanwere azụ. Mana ka oge gatụrụ, e mechara were ego ayoro were na-atụ mgbere ahịa. Ugbua, ahịa Igbo a kacha mara amara bụ otu Nkwọ Ọnịcha nke a na-akpọ ""Onitsha Main Market"" na Bekee. A na-eche na ọ bụ ya bụ ahịa kacha buo ibu n'ọdịda anyanwụ Afrịka. E nwekwara Eke Ọka, Nkwọ Nnewi, Eke Ekwulobia, Afọ Nnobi dgz. Ha niile dị n'Anambara steeti. Ị gaa na steeti Imo, Orie Amarakụ bụkwa ahịa a ma ama na mpaghara Ọlụ dị n'Imo Steeti. Ndị ọzọ dị n'Imo steeti bụ Eke Ọnụnwa, Afọ Ugiri, Nkwọ Achị, dgz. Enugwu nwere Eke Obinagu, Afọ Obollo, Orie Ezeagụ, dgz. N'Ebọnyị, ị ga-anụ maka Eke Imoha nke dị n'Onueke, Ezza, e nwekara Eke Afikpo, Orie Amasịrị, dgz. Ndị Abịa nwere ahịa Eke ọha dị n'Aba, Orie ụgba n'Ibeku, Nkwọ Amachi na Nsulu, Ngwa, Eke Uzuakọlị dgz. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49524789 +health Men's Health: Ọrịa isii kacha emetụ ụmụnwoke karịa ụmụnwaanyị "Ndị Igbo na-ekwu okwu sị na mmadụ na ibe ya ha bụ n'ọnụ, maka n'ezie, mmadụ niile abụghị otu. N'otu aka ahụ, nwoke na nwaanyị abụghị otu, ya kpatara na ọrịa ụfọdụ ka emetụta ụmụnwoke karịa ndị nwaanyị. Oge niile ka ndị ọkachamara na ndị ọkammụta sayensị na-esi imi n'ala ịchọpụta ihe na-akpata ọrịa, mana ọtụtụ n'ime ha ekwekọrịtala na ụfọdụ ọrịa na-abịara mmadụ n'ihi na onye ahụ bụ nwoke maọbụ nwaanyị. Akụkọ a ga-agbado ụkwụ n'ọrịa ndị kacha emetụta nwoke karịa nwaanyị. Lee ụfọdụ n'ime ha ebe a: Nwoke ọbụla katawarala ahụ kwesịrị ịga mee nnyocha mara ma agede ya akwụkwa chịm. Agede bụ akụkụ ahụ nke Bekee kpọrọ 'prostate'. Ọ bụ mkpụrụ dị n'etiti amụ na akpa mamịrị. Akwara si akpa mamịrị gafere n'ime ya. Ọrụ agede, dịka ndị ọkammụta sayensị siri dee bụ imepụta mmiri na-enye miri utu aka. Ọrịa na-emetụta agede nwoke gụnyere: Okuko Agede (Prostatis), Agede itofe oke (Prostate Hypertrophy) na Akpụ Agede (prostate cancer). Ọ bụ ịṅụ ọgwụ maọbụ ịwa ahụ ka e ji agwọ ọrịa ndị a. Ọ na-adịkwa mma ma onye bu ọrịa a chọpụta ya n'oge, ka o nwee ike malite ịnata ọgwụgwọ ọsịsọ. Nke a bụ mgbe ihe dịka kịrịkịrị okwute malitere ịpụta n'akpa mamịrị mmadụ. Ihe na-akpata nke a bụ mgbe ihe na-emepụta mamịrị gbakọrọ ọnụ ma kpọọ nkụ n'ime ahụ mmadụ. Nnyocha gosiri na ọrịa a karịrị n'ụmụnwoke karịa ụmụnwaanyị. Ndị ọkachamara kwukwara na ọrịa a na-aka njọ ma nwoke katawa ahụ, ihe dịka malite n'afọ iri ise gbagowe. A na-eji ịwa ahụ nke ""Transurethral cystolitholapaxy"" bụ otu usoro n'ime ya were agwọ ya. Mana ndị ọkachamara na-adụkwa ọdụ ka onye bu ọrịa a na-aṅụ mmiri iji kpochapụta ya. E wepụ ọrịa akpụ nke ara bụ 'breast cancer' na Bekee, nnyocha gosiri na ọ bụ ụmụnwoke ka ọrịa akpụ ndị ọzọ kacha emetụta. Ndị a gụnyere ọrịa akpụ nke ọnụ (oral cavity cancer), ọrịa akpụ nke mgbịrịafọ (colon cancer), ọrịa akpụ nke akịrị (kidney cancer), dgz. Ndị ọkammụta sayensị na-ekwu na nke a nwere ike ịbụ maka na ọ bụ ụmụnwoke na-emekarị ihe nwere ike ịkpata ụdị ọrịa ndị a, dịka ise anwụrụ nakwa ịṅụ mmanya na-aba n'anya. Otu ụzọ a na-ejikarị agwọ ọrịa ndị a bụ site n'iwa ahụ. Ọrịa pakịnsọn bụ mgbe ike malitere ịgwụ ụbụrụ mmadụ ma onye ahụ kawa nka na-akpata ya. Ọ bụ ma mmadụ kawa nka ka ya bụ ọrịa na-apụtakarị ihe. Otu ihe e ji ama ya bụ aka ịma mmadụ jijiji n'ihi na ike agwụla njikọ ọkpụkpụ nakwa anụahụ. Ndị nnyocha kwuru na ọrịa a ka njọ na nwoke karịa na nwaanyị. Muhammad Ali bụ ọpịa ọkpọ bụ otu onye a ma ama rịara ọrịa a tupu ọ nwụọ. Ruo ugbua ọrịa a enwebeghi ngwọta, mana a na-enye ndị mmadụ ọgwụgwọ na-enyere ha aka ibi ndụ ha, site n'ịṅụ ụfọdụ ọgwụ nakwa ịwa ahụ nakwa nke Bekee kpọrọ ""physiotherapy"". 5) Mkpọnwụ ahụ (Stroke) Ọ bụrụ na ọbara anaghị eru n'ụbụrụ mmadụ nke ọma, o nwere ike ime ka 'cell' dị n'ụbụrụ nwụọ. Nke a mee, o nwere ike ime ka otu akụkụ ahụ mmadụ maọbụ nke ọzọ kpọnwụọ. Ihe na-akpata mkpọnwụ ahụ gụnyere oke ise anwụrụ, oke ibu, ọrịa shuga, ọke mmanya na-aba n'anya, anaghị emegharị ahụ, dgz. Nnyocha gosiri na ụmụnwoke ka enwe ọrịa mkpọnwụ ahụ karịa ụmụnwaanyị. Mana ọrịa a ka emesi ụmụnwaanyị ike ma o mee ha karịa ụmụnwoke. 6) Ọrịa obi (Heart disease) Ọrịa obi nke kacha emetụta ụmụnwoke bụ nke a kpọrọ 'coronary heart disease' na Bekee. Ihe na-akpata ya bụ mgbe ọbara anaghị erucha n'obi mmadụ otu o kwesịrị. Ọtụtụ ihe na-akpata mkpọnwụ ahụ (stroke) bụkwa ha na-akpata ọrịa obi. Nnyocha gosiri na ọrịa obi na-aka ejitu ụmụnwoke karịa ndị nwaanyị. Ụzọ kacha mfe e si agwọta ọrịa obi bụ ma a chọpụta ya n'oge. Ya kpatara ime nnyocha kwa mgbe kwa mgbe ji dị ezigbo mkpa. Ọrịa ọzọkwa na-emetụ ụmụnwoke enweghị ike ịtụwa nwaanyị ime. Nchọpụta gosiri na ọrịa a na-agbali elu ugbua n'ime ụmụnwoke. O nwere ọrịa dị icheiche nwere ike igbochi nwoke ịtụwa nwaanyị ime. Nke mbụ bụ mmechi mpio ebe ughe si apụta (sperm blockage), nke abụọ bụ ụghe anaghị agbazu agbazu (low sperm production), nakwa ughe anaghị akpa agwa etu o kwesịrị (abnormal sperm function). Ise anwụrụ, ịṅụ ọgwụ ike, ịṅụ oke mmanya, ibu oke ibu, dịrị gawazie, socha na ihe nwere ike ịkpata ụdị ọnọdụ a. Ihe ndị a nwere ọgwụgwọ ma a malite n'oge lebanye ya anya. Mana nke a abụghị ihe mmadụ ga-eji aka ya mee. Onye nwere ụdị ọrịa a kwesịrị ịga ụlọọgwụ ka dọkịta nyere ya aka." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53269503 +business Ndị Igbo nọ Morocco na-agba mbọ e ji mara ndị Igbo Anyị hụrụ ọtụtụ ụlọahịa ndị Igbo nwe na Morocco. Otu n'ime ụlọahịa ndị a bụ ebe a na-ere nri, nke Chidinma Ani nwe. Chidinma hụrụ na nri ndị Morocco anaghị amasị ọtụtụ ụmụ Igbo nọ na Morocco. Ọ hụkwara na ngwa nri e ji esi nri Igbo abụghị ihe ị ga-ahụ ebe ọbụla na Morocco. Nke a mere o ji bute uche isi Naịjirịa atụbata ngwa nri ndị Igbo dị iche iche na Morocco. Nke a bụ nsogbu ka o gboro ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ ebe ha ga-esi egote ngwa nri ha ga-eji esi nri na-agụ ha. Chidinma esila ebe ahụ na-enwete ego o ji elekọta onwe ya na ezinaụlọ ya. Nwafọ Igbo ọzọ anyị hurụ bụ Samson Nnaji na-akpụ isi na Casablanca, Morocco. Samson bidoro ịkpụ isi na Naịjirịa mgbe ọ ka nọ ụlọakwụkwọ sekọndịrị n'afọ 2000. Ọ sị na mgbe ọ nwetere onwe ya na Morocco na Disemba n'afọ 2021, ọ laghachikwa n'akaọrụ ọ mụtara n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị na Naịjirịa. Ugbua, Samson enweela ụlọọrụ ebe a na-akpụ isi, na-emekwa ọfụma. Ndụmọdụ ọ na-enye ndị mmadụ bụ na akaọrụ ọbụla ị na-eme, na-emesi ya ike, ị maghị ebe maọbụ mgbe ọ ga-abara gị uru. Dịka ọrụ isi na-enye Samson ego, ọtụtụ ụmụnwaanyị Naịjirịa na-eme isi na Morocco gwara anyị na ọrụ isi anaghị agachara ha ahịa maka na ọtụtụ ụmụnwaanyị anaghị eme isi na Morocco. Ụfọdụ n'ime ha sị na ha na-achọ ụzọ ha si alaghachite Naịjirịa. https://www.bbc.com/igbo/articles/c4nxe782zw4o +business "Ogbambọ: ""Etu m si kpụgharịa ụgbọala a site na ntuziaka m hụrụ na nrọ""" "Nonso Ofor bụ onye Oraifite n'Anambra Steeti kwuru na o ji aka ya rụpụta ụgbọala a nke wuru ewu na soshal midia. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ọ sị na ihe ndị ọzọ ọ na-arụ gụnyere ihe e ji egwu mmiri, ncha nakwa efere e ji asa ahụ a kpọrọ ""Jacuzzi"". Ofor sị na o ji injine ụgbọala Venza hazigharịa ụgbọala dị ka ụgbọala ""Rolls Royce Phantom"". Ọ sị na amamihe o jiri mee nke a si na ihe e gosiri ya na nrọ mgbe ọ na-ehi ụra, na e nwekwara ọtụtụ ụgbọala a na-egosi ya nke ọ na-arụbeghi. N'olu ya "" M na-arụ ụra, a na-egosi m ọtụtụ ụgbọala na nrọ, mana m pụta n'ihe rụọ ya, o gosipụta ihe ahụ m hụrụ na nrọ."" O kwukwara na ewezuga ingine ahụ, ihe ndị ọzọ nille gbasara ụgbọala a bụ aka ka o ji rụọ ya. Ofor sị na ọ chọpụtara na ọ bụ ihe ọ na-arụpụta n'aka ya bụ ihe na-enye ya ego. O kwuru na akụrụngwa o ji arụ ụgbọala a bụ ihe ndị o nwetachara na Naịjirịa ebe a. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ naanị akwụkwọ Sekọndịrị ka ọ gụrụ tupu ọ gawa igba bọị ma chọtazie akaraka ya. Ofor kwuru na o si Legọs steeti ebe ọ rụpụtara ụgbọala a buru ya bịawa Ọwụwa Anyanwụ. N'ikpeazụ ọ sị ""Obi dị m ụtọ na ndị mmadụ nabatara ihe m na-eme"". Gere ihe o kwuru ebe a n'ujụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60187419 +health Coronavirus Tips: Ahụ onye nwụrụ anwụ o nwere ike ibufe mmadụ coronavirus? Ọrịa coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ 40 na Naịjirịa. Nke mere ka ngalaba 'National Centre for Disease Control' wepụta ndụmọdụ etu e kwesịrị isi lie onye ya bụ ọrịa gburu. Ọ bụ eziokwu n'ozu onye nwụrụ anwụ anaghị ekesa ya bụ ọrịa nke ukwu, mana ọ kwesịrị ka ndị mmadụ kpachapụ anya. https://www.bbc.com/igbo/media-52494528 +politics Ihe ị kwesịrị ịma maka Ademola Adeleke zọtara ọkwa gọvanọ Osun steeti Ademola Jackson Adeleke nke ji ọkọlọtọ pati People's Democratic Party (PDP) zọọ ọkwa gọvanọ Osun steeti, abụrụla gọvanọ steeti ahụ dịka o meriri ya bụ ntuliaka. Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) kwuputere na o ji mkpokọta vootu 403,371 merie Adegboyega Oyetola nke pati APC nwetara vootu 375, 027. O meriri Okpuruọchịchị 17 n'ime 30 dị na steeti ahụ. https://www.bbc.com/igbo/articles/c0x1jz7v6jwo +religion CAMA Act: Fada Mbaka akatọọla iwu 'CAMA' "Fada Ejike Mbaka adọọla gọọmenti aka na ntị ka ha wepụ aka n'okwu gbasara ụlọụka tupu ha anọrọ n'oche ọchịchị ree ure. 'CAMA' bụ iwu gbasara etu e si edebanye aha ụlọọrụ ọbụla na Naịjirịa nke gụnyere ụlọụka nakwa ụlọọrụ na-abụghị nke gọọmentị nke bekee kpọrọ 'Non-Governmental Organisations' nke e megharịrị na nsonso ma nye gọọmenti ikike iwepụ onyeisi ụka maọbụ NGO ma ọ bụrụ na e nwee ebubo nrụrụaka. Fada Ejike Mbaka, onye gbarụrụ ihu maka iwu 'CAMA' tata bụ Wenezde n'ọgbakọ 'Adoration' o nwere n'Enugwu gwara gọọmenti ka ha wepụ aka na CAMA ahụ dịka o kwuru na-akwado imegbu ụka. ""Unu bụ gọọmentị gbaso ụka mgba, unu nwere ike ree ure n'oche ọchịchị."" ""Onye ọbụla na-agba ụka mgba na-agba christ mgba."" Ọ gara n'ihu kwụọ sị, ""Obi adịghị m ọcha. Oge adịghị anya, Mụọ Chukwu ga-eme ihe ga-ama obodo Naijiria jijiji."" Mbaka gwara Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o cheta nkwa niile o kwere tupu ọbata n'ọchịchị. Fada kwuru na ọ bụrụ na ndị gọọmenti ewepụghị anya na Ụka, ụfọdụ n'ime ha nwere ike ire ure n'oche ọchịchị. Mbaka kwuru na gọọmenti kwesiri ị na-enye ndị ntorobịa ọrụ, ime ka nrị dị n'obodo nakwa ọtụtụ ihe eji enyere ndụ aka karịa itinye anya na ka ụka chineke sị aga. Otu jikọrọ ndị okpukpere Kraịst bụ 'Christian Association of Nigeria (CAN) ajụla iwu ọhụrụ e mere maka ihibe otu maọbụ ụlọọrụ na Naijiria a kpọrọ 'Companies and Allied Matters Act' si na ọ bụ ""akaọrụ ekwensu."" N'ozi nke Adebayo Oladeji bụ onye enyemaka pụrụ iche nye onyeisi CAN bụ Samson Ayokunle wepụtara, CAN sị, ""Ndị ndu otu 'Christian Association of Nigeria' jụrụ kpamkpam iwu 'Companies and Allied Matters Act, 2020' nke onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka na nsonso a."" Ọjụjụ CAN na-ajụ iwu a na-abịa dịka otu na-agba mbọ maka ikike dịrị onye bụ Socio - Economic Rights And Accountability Project (Serap) na-ekwu na ha ga-akpụpụ gọọmenti ụlọikpe maka iwu ahụ ha kpọrọ ""iwu mkpagide"". Iwu ọhụrụ a kpọrọ 'CAMA' n'aha ịchafụ ebutela nnukwu nghọtahie na Naịjirịa. Serap kwuru si, "" Iwu 'Companies & Allied Matters Act (CAMA) 2020' bụ iwu mkpagide kachasị kemgbe Naijiria ji bido."" ""A ga-eji ya gaa n'ihu ịkpagbu ikike dịrị ụmụafọ. Anyị ga-agbagha ya n'ụlọikpe."" Ọtụtụ ndị mmadụ nwere agba gụnyere ndị isi ụka, akatọọla iwu ha sị na ọ bụ iji iko kunye enwe mmiri, n'ihi na gọọmenti nwereike isi n'azụ ụlọ napụ ndị mmadụ ikike dịrị ha. Dịka ọkaiwu a ma ama bụ Femi Falana si kwuo, iwu ahụ a hazigaharịrị nke nyere ngalaba gọọmenti ikike iweghara otu nke onyeisi ya dajọrọ, megidere iwu Naijiria. ""O megidere ikike dịrị mmadụ ịgbakọ dịka o si dị n'akụkụ 40 nke Iwu Naijiria."" Cheta na onyeisi ụlọụka 'Living Faith Church' bụ David Oyedepo tinyere ọnụ n'okwu a n'ụbọchị ụka gara aga. O kwuru na o nweghi gọọmentị ọbụla pụrụ ịtinye mmadụ ka o lekọta ụlọụka ọbụla si ahazi onwe ha. ""Naịjirịa bụ ebe ndị mmadụ nwere mwereonwe n'ofufe, atụmatụ a bụ ụzọ a chọrọ iji jichi ụlọụka"" ka o kwuru n'ihe onyonyo na-efegharị Gere ya n'uju ebe a: Ya bụ iwu gbasara etu esi edebanye aha ụlọọrụ ọbụla na Naịjirịa nke gụnyere ụlọụka dị icheiche nakwa ụlọọrụ na-abụghị nke gọọmentị nke bekee kpọrọ 'Non-Governmental Organisations'. Ọ bụ iwu CAMA ka e ji hibe ngalaba 'Corporate Affairs Commission' nke ọrụ ya bụ idebanye aha ụlọọrụ dị iche iche n'akwụkwọ gọọmentị. Mana ihe na-akpata nghọtahie na ya bụ iwu bụ ebe o kwuru na gọọmentị nwere ike iwepụ onyeisi ụlọọrụ maọbụ ụlọụka ọbụla ma tinye onye ọbụla dị ha mma ma ọ bụrụ na e nwee mkpesa na ndịisi ụlọọrụ maọbụ ụlọụka ahụ tinyere aka na nrụrụ aka. Ụfọdụ cheere na akụkụ 839 dị n'ime ya bụ ụzọ gọọmentị si chọọ ịtinye ụkwụ n'ihe na-eme n'ụlọụka. Ndị ọzọ dịka Roland Nzimora chere na ọ bụ ezi ihe ma gọọmentị chọọ ịtịnye otu anya n'ihe na-aga n'ụlọụka Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ ụfọdụ ihe dị n'iwu 'Social Media Regulation' bụ nke ụmụ Naịjirịa kwuru na ha achọghị, ka ndị omeiwu tinyere n'ime iwuo ọhụrị a. Gịni ka ọ pụtaara ụlọụka dị icheiche? Otu onye ọkaiwu bụ Amarachi Nwankwo gwara BBC Igbo n'ekwentị na iwu ọhụrụ a dị mma n'ebe ụlọụka nọ. O kwuru na ihe iwu a pụtara bụ na gọọmentị ga na-elebanye anya n'ihe na-aga n'ụlọụka etu ha si elebanye anya n'ụlọọrụ ọbụla dị icheiche. Nwankwo kwuru sị: ""Ụlọụka ọbụla dị na Naịjirịa nọ n'okpuru CAC (Corporate Affairs Commission) nke nọ n'okpuru CAMA, ya mere na iwu ọbula CAMA tinyere ga-emetụta ha"" ""Ọ bụkwa iji chekwaa ndị mmadụ n'ebe ụlọụka adịgboroja nọ, ọ bụghị ịbanye n'ebe ahụ were oche eze ka iwu a bịara ime"". Kedụ ihe ndị ụkọchukwu na-ekwu? Ihe ọhụrụ dị n'iwu CAMA nke a emegharịrị ọhụrụ buru ibu. Ọtụtụ ndị ọkaiwu kwuru na ya bụ iwu mara mma n'ihi na o mere ka ọ dịwanye mfe mmadụ idebanye aha ụlọọrụ ya. Lee ụfọdụ ihe ndị dị iche na'iwu CAMA nke ochie na nke ọhụrụ. Ị chọọ ịgụ iwu CAMA nke ọhụrụ a n'uju, lee ya ebe a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-53826215 +sports Frank Lampard Out: Gịnị mere e ji asị Lampard 'buru ngwongwo gị laa'? "Na-erughi otu izu Chelsea kpọpụtara aha Frank Lampard dịka onye nchịkọta ọhụrụ ha, ndị na-akwado otu a ekwuwela ka a chụọ ya n'ọrụ. Ndị na-akwado ha ekweghi ka ike ya nọrọ ala ọfụma n'oche dịka onye nchịkọta, tupu ha amalite ịkpọku ndị were ya n'ọrụ sị ha sepụ oche ahụ. Ha bidoro ihe a kpọrọ ""#LampardOut"" n'elu soshal midia. Ha na-aba mba na na-emebeghi eme ọ mawala ụkwa dịka onye nchịkọta; nke a si n'onye lawa onye lawa ndị Chelsea na ndị Bohemian dị n'obodo Dublin, Ireland, gbara na ""pre-season"" ha. Ebe ụfọdụ kwuru ka e nye ya ohere makana o tebeghi aka ọ batara nchịkọta, ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ ụdịrị ihe a mere ha ji atụ ụjọ maka ọchịchị e nyere ya. Ndị ọzọ kwuru na maka ụdịrị ike ọ kpaara Chelsea oge ọ na-agba bọọlụ, na ọ gaghị amasị ha ka ọ bata mechuo ihu ya na aha ya. Nye ụfọdụ ndị, ọ gbasaghị ha na ọ bụ naanị mkpụrụ ụbọchị isii ka ọ nọrọla n'oche nchịkọta Chelsea tupu ha agbaa bọọlụ ahụ. Ndị dịka @SgtCrackers kwuru sị ka ọ pụọ ugbua chi ka dị. Otu onye gara mepee akara Twitter ọhụrụ ọ kpọrọ ""@LampardOutCFC"", ebe ọ nọ kwuo ka a chụọ Lampard ụkwụ eru ala ma kpọghachịta Jose Mourinho chịkọburu Chelsea. @charlesomolo15 kwuru sị ndị mmadụ kwụsịkwa ịkpa ""agwa ọjọo"" a. @adesanyadarking dere sị na ọ gbagwojuru ya anya na ndị mmadụ ga na-achọ ka a chụọ Lampard. Kedụ ụdịrị egwuregwu na-amasị gị?" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48957618 +health Vitamin D na uru ọbara n'ime ka ọkpụkpụ sie ike n'ahụ mmadụ "Ahụ mmadụ nwere akụrụngwa dị iche iche na-enyere ya aka ịrụ ọrụ nke ọma ma gbochie ụfọdụ ọrịa dị aṅaa. Akụrụngwa ndị a gụnyere ọtụtụ vitamin nke vitamin D so n'otu n'ime ha. Vitamin D bụ akụrụngwa ndị ahụ mmadụ chọrọ n'ebe ọ dị obere iji rụọ ọrụ ọfụma ma kwalite ndụ. Vitamin D dịka aha ya si dị abụchaghị Vitamin kama ọ bụ akụrụngwa na-enye aka n'imepụta 'homonu dị n'ahụ mmadụ. Kedụ ebe e si enwete vitamin D? Onye dọkịta na-ahụ maka nyocha bụ Chris Ohakpolamugwo sị ndị mmadụ na-eche na ọ bụ anwụ n'enye vitamin D n'ahụ na nke bụ asị Ọ sị na ""eziokwu bụ na anwụ anaghị enye vitamin D kama na anwụ na-enye aka ịmịpụta ya n'ahụ mmadụ. O kwuru na ụzọ kachasị mma iji mịpụta vitamin D n'ahụ mmadụ bụ site n'ịnwa anwụ nke ọma ọkachasị anwụ ụtụtụ. Ebe ọzọ e si enwete bụ site n'iri ụfọ nri ndị pụrụiche ọkachasị ndị na-enye 'calcuim' gụnyere; Vitamin D na-arụ ọrụ buru ibu n'ahụ mmadụ nke gụnyere ime ka ọkpụkpụ na eze gbasie ike, ichekwa ahụ megide nje ịbata na ihe ndị ọzọ. Ọkpụkpụ na eze gbasie ike Vitamin D na-achịkwa 'calcium' na phosporus dị n'ọbara nke na-enyeaka ka ọkpụkpụ ahụ gbasie ike. Ibuso ọrịa agha Nyocha ndị ahụike mere bụ nke e nyochagharịrị n'afọ 2018 gosiri na vitamin D na-enyeka ibuso ọrịa dịka influenza agha. Nyocha ọzọ e mere na nso nso a gosikwara na ọtụtụ ndị na-ebute ọrịa coronavirus kachasị na ndị vitamin D kọrọ n'ahụ. Nke a pụtara na otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, vitamin D na-enyeaka ibu agha megide ọrịa coronavirus nakwa ọrịa iku ume ndị ọzọ. Nyocha ka na-aga n'ihu ịmata kpọmkwem etu vitamin na-eji ebuso coronavirus agha, mana ndị ọrụ ahụike enyela ndụmọdụ ka a na-aṅụ akụrụnbwa vitamin D ọkachasị n'oge oyi. Vitamin D na-enyekwa aka iwulite ahụike ụmụaka a mụrụ ọhụrụ site n'ime ka ha too ọfụma ma gbasie ike dịka ngalaba ahụike ụmụaka nke mahadum John Hopkins si depụta ya. Ime ka nwaanyị dị ime gbasie ike: Ozi si n'aka otu ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) sị na ọ dị mma ka nwaanyị dị ime inwe vitamin zuruoke n'ahụ ya. Ha sị na ọ na-enye aka ịmụ nwa buru ebu ma gbasie ike, ma gbochiekwa ịmụ nwa na-akaghị aka mgbe oge ya erubeghi. Mana ha dọrọ aka na ntị ka a kpachapụ anya etu e si aṅụ ọgwụ ndị na-enye vitamin D maka ọghọm dị na ya. Ọ bụ eziokwu na ahụ mmadụ na-amịpụta vitamin D mana mgbe ụfọdụ ọ naghị ezu oke. Ihe nwereike ịkpata ezughi oke a gụnyere ụdị anụ ahụ mmadụ nwere, mmadụ ịnọkaarị n'ebe anwụ na-adịghị acha, mpaghara ụwa mmadụ bi nakwa etu e si chee nwata ara. E nweghi vitamin D n'ahụ nwereike ibute; Igbo tụrụ ilu sị na 'imebiga ihe oke adịghị mma', n'otu aka hụ ndị ọrụ ahụike sị na ọ bụ eziokwu na vitamin D dị mma n'ahụ mana ọ dịghị ka karịa n'ahụ mmadụ. Ọ bụrụ na ọ karịa, o nwereike ibute ọkpụkpụ, akwara, nakwa ihe ndị isi ike nke ga-egbochi ọbara agazughi n'ahụ ka o kwesịrị." https://www.bbc.com/igbo/afirika-54825122 +health Coronavirus Lock Down: 'Etu m si ebi ndụ m na London kemgbe mmachi ngagharị malitere' Dịka a si ndị mmadụ n'ọtụtụ ebe n'ụwa ugbua nọrọ b'ụlọ iji hụ na-akwụsịrị mbawanye coronavirus, Duchess Nnenna nọ London gosiri etu ha Jiri ebi na London. Ọ sị na ya na-agba mbo ịhụ na ha rụpụtara ihe anya na-ahụ kwa ụgbọchị. Lee ka o si kwụrụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52182501 +business Nigeria's debt burden: A naghị ama ihe ndị na-achị achị ji ego ha bitere eme- Chizea Onye ọkachamara n'okwu akụnaụba bụ Boniface Chizea, kọwara ụzọ ụmụ Naijiria si eketa oke n'ụgwọ Naijiria jiga. https://www.bbc.com/igbo/afirika-49497174 +politics Ọ bụrụ m bụ onyeisiala, a kara m iritu n'ọkwa - Onaiyekan "Archibishop ụlọụka Katọlịk dị n'Abuja kwuru nke a ma gbarụọ ihu kwuo na ndị ọchịchị emeela ka Naịjirịa bụrụ mba ndị mmadụ achọghị ịnọzi na ya O kwukwara na nke a kpatara na ụmụ ntorobia na-agbaga mba Yurop n'ụzọ ezighi ezi. Ka ọ dị ugbua, Manchester United enweghi ebe ha ji azụ aga gbasara ibanye n'ogogo ndị nọ n'ọkwa otu ruo anọ na tebulu Premier League. Huddersfield gbara mbọ hụ na ha tinyere Man Utd n'ọnọdụ ""gawa agawa adịghị mma, lawa alawa adịghị mma"". Scott McTominay nke Man Utd bu ụzọ kpaa ike ka o nyere goolu na nkeji asatọ e ji malite asọmpi a. Mana Isaac Mbenza nke Huddersfield gbajiri nku ha ji na-efe ka ọ gbanyere goolu ha ji saa ya na nkeji 60 nke ọkara nke abụọ. Ntu a Huddersfield kpọrọ ha pụtara Man Utd agaghị eso ndị ga-agba na Champions League nke afọ na-abịa. Otu IPOB akatọọla aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi nakwa onyeisi Ohaneze Ndị Igbo bụ Ogbonnia Nwodo. Ha mere nke a dịka Nwodo na Umahi gọrọ aka na ụkwụ ha n'iwu Ipob nyere sị ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ n'ụbọchị 30 nke ọnwa Mee iji cheta ndị nwụrụ n'agha Biafra. Onye zọrọ oche osote onyeisiala n'okpuru pati PDP bụ Peter Obi ekwuputela ụjọ ya gbasara ọdịnịhụ Naịjirịa. Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ mgbasa ozi Sun nke Naịjirịa nwere, Obi tụtara alọ etu NaịJirịa ga-esi gbanahụ nsogbu enweghị ọrụ ,iji ụgwọ nakwa ime ka ego ana-amapụta maka nchekwa obodo ghara ịla niyi. Asọmpị Premier League ka chi ọkụ dịka otu egwuregwu Chelsea nakwa Watford ga-achịpụ ya n'ụbọchị may 5 bụ taa n'ọgbọ egwuregwu Stamford bridge. Huddersfield na man utd ga-ama aka n'elekere abụọ nke ehihie n'ọdọ egwuregwu John Smith ebe Arsenal na Brighton ga-ma onye ike ga-agwụ n'elekere anọ na ọkara. Ụfọdụ pati ndọrọndọrọ ọchịchị ha na nke na-achị Naịjiria na-ama aka akatọla etu ndị agha Naịjirịa si pụta kwuo, na ụfọdụ mmadụ na ndị mba ofesi na-agba mbọ ịhụ na ha ghasasiri mmemme may 29 ga-edubanye onyeisiala Muhammadu Buhari n'ọchịchị nke ugboro abụọ. Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha naịjirịa bụ Sagir Musa boro pati ndị a ebubo a, ma kwukwa na ndị mba ofesi chọrọ ibute ọgbaghara n'etiti otu dịka 'Multinational Joint Task Force' na-agbaso ndị omekome dịka Boko Haram mgba. Ndị agha gaza atụpụla ogbunigwe ruru narị abụọ na mba Israel dịka ndị agha Israel si kwuo. Nke a butere ntụghachi ogbunigwe na ogige Palestine. Mgbọ israel ji zaghachi ndị Palestine gburu mmadụ anọ gụnyere nne na nwa dịka ụlọrụ dị na gaza si kwuo." https://www.bbc.com/igbo/afirika-48167225 +politics Governor Soludo's swearing-in: 'Anyị agaghị eji ego ndị Anambra gbaa origo' - Charles Soludo "E duru Charles Chukwuma Soludo iyi ọrụ dịka gọvanọ ọhụrụ n'Anambra steeti n'ogige gọomentị steeti ahụ taa bụ ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị, 2022. Soludo abụrụla gọvanọ nke isii steeti ahụ. E dukwara Onyekachi Ibezim iyi ọrụ dịka osote gọvanọ Anambra Steeti. Kirie ihe onyonyo a ka ị hụ etu Dkt Ibezim na Ọkammụta Soludo si ṅụọ iyi ọrụ ha: Joe Anatune bụ onye nchịkọta mgbasaozi 'Soludo Media' sị na ya bụ emume nke ọtụtụ mmadụ agaghị abịa ga abụ n'obi ndị gọọmentị Anambra steeti dị n'Agụ Awka. Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ nwere agba bụ ndị a kpọrọ oku abatawala n'ogige ahụ. Onye okaikpe steeti ahụ bụ Onochie Anyachebelu duru ha abụọ 'iyi ọrụ. Ọkpụrụkpụ okwu sị n'Okwu mbụ Gọvanọ Charles Soludo kwuru dịka gọvanọ ""Akwụ m nzọmụkwụndị bu m ụzọ"" Kedụ ihe o kwuru maka mmepụta ego? Ọkammụta Patrick Utomi, Chiwetalu Agu, Bianca Ojukwu na ndị ọzọ bịara ya bụ mmemme Ọkammụta Pat Utomi so na Transition komitee Ọkammụta Soludo hibere maka iwepụta atụmatụ nchịkọta steeti bịakwara gara emume ido n'iyi ọrụ Soludo. Odoziakụ Bianca Ojukwu, nwaada aka chibụrụ Anambra steeti bụ CC Onoh nakwa nwunye Ike mba Nnewi; Chukwuemeka Odimegwu Ojukwu bụbu onyeisi agha duru agha Biafra. Bianca Ojukwu ka ọ nọ ebe a na-eche ka ịṅụ iyi bido. Tupu ya bụ esemokwu n'etiti ya na Ebere Obiano eme. Chiwetalu Agu bụ onye amaama na-eme ejije Nollywood bịakwara emume idu n'iyi ọrụ Soludo" https://www.bbc.com/igbo/60756455 +sports Amarachukwu Lilian Eze: Ahụhụ m tara n'ịgba bọọlụ dịka nwaanyị mere m ji malite ikuziri ụmụaka egwuregwu Amarachukwu Lilian Eze bụ onye nwe 'Lilly Legends Sports Academy' sị na ọ bụ ahụhụ ọ tara mgbe ọ na-amalite ịgba bọọlụ dịka nwaanyị mere o ji hiwe ụlọakwụkwọ ebe a na-akuziri ụmụmaka egwuregwu. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Amarachukwu kọwara na nne na nna enyeghi ya nkwado ịgba bọọlụ, nke mere o ji raa ya ahụ na mmalite. Kama o mechara hapụ ebe ha gawa mba Afrịka ndị ọzọ dịka Senegaalụ na Equitorial Guinea bụ ebe ọ nọ gbata bọọlụ nke ọma. Ọ sị na o si ebe ahụ banye zie na mba Eshia tupu ọ laa ezumike nka ma lọghachizie Naịjirịa malite nkuzi egwuregwu. Ụdị egwuregwu ndị ọ na-akụzi gụnyere bọọlụ ụkwụ, ịgba karatị a na-akpọ Taekwondo, igwu mmiri dgz. Eze nyere ndị nne na nna ndụmọdụ ka ha kwado ụmụ ha n'ihe banyere egwuregwu ma ọ bụrụ ha nwee mmasị na ya. Kirie ihe o kwuru n'uju; https://www.bbc.com/igbo/afirika-55242238 +sports Chelsea vs Liverpool: Chelsea akwọriela Liverpool kpọọ ha n'imi ka ụtaba Ndị Chelsea jị ụtali igwe pịakaa Liverpool ahụ oge ha abụọ zutere n'asọmpi FA cup n'abalị Wenezde. Goolu abụọ asataghị asata ka ha ji chụlaa Liverpool. Nkata ka Liverpool gaara iji buru goolu, mana ndị Chelsea riri ọtụtụ goolu ha kaara inye. William bu ụzọ nye goolu na nkeji 13, ebe Ross Barkley nyere goolu nke ya na agba nke abụọ. A ga-ama onye bụ 'azụ eru ala' n'etiti Chelsea na Liverpool ka ha ga-ezute n'asọmpi Iko FA n'iji tozuoke n'agba anọ nke ikpeazụ n'elekere asatọ nke abalị a. Obi adịla na mbụ koro ọtụtụ ndị nkwado ha n'elu maka na ọ bụ onye e meriri ọ kwakọrọ ngwonwo ya laarie. Mana dịka a sị na anaghị asọ mgbagbu ghara ọgụ', onye ọbụla nwere olileanya na otu ọ na-akwado ga-emeri. Ndị a ga-achọ achọ n'asọmpi a A bịa na Chelsea, ndị dịka Tammy Abraham, Ngolo Kante na Christian Pulisic agaghị agba bọọlụ ebe o dobeghi anya ma Andreas Christensen ọ ga-agba. Na Liverpool ndị dịka Jordan Henderson, Naby Keita, Xherdan Shaqiri na Nathaniel Clyne agaghị eso gbaa mana Joe Gomez na James Milner ga-apụta n'ọgbọ. Nke a mere ọtụtụ ndị ji eche na Liverpool nwereike imeri Chelsea tinyekwara na ha bụ ndị mbụ n'ogogo tebụlụ Premier League. Ugboro ole Chelsea na Liverpool na-ezute onwe ha n'asọmpi FA Nke a ga-abụ nke mbụ otu abụọ a ga-ezute ibe ha kamgbe ha zutechara n'agba ikpeazụ n'afọ 2012 mgbe Chelsea ji ọkpu goolu abụọ asatara otu merie. Chelsea emeriela Liverpool ugboro ise n'ime asọmpi FA asaa ha zuterela. Mana asọmpi a ga-abụ ugboro atọ ha ga-ezute onwe ha n'afọ a. Liverpool emeriela Chelsea ugboro abụọ gụnyere asọmpi Uefa Super Cup. Ajụjụ a na-ajụ bụ ma Liverpool ọ ga-ama afọ n'ala ọzọ dịka Watford gbachara ha ọkpụ goolu atọ n'ụbọchị anọ gara aga? Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51717717 +entertainment Naira Marley: Lee ihe mere izuụka a ji bụrụ Sekem Sịte na ndọrọndọrọ ọchichi ma rụọ na ndị na-eti egwu, izuụka a kpụ ọkụ n'ọnụ. Ka anyị bido na ihe gbasara ụlọụka COZA na otiegwu Davido, Wizkid na Tiwa Savage. 1) COZA na ndị otiegwu Ihe so wụo ewu n'ịzu a bu akụkọ na-ekwu na ndị ụka COZA jị ụzọ aghụghọ tinye ndị otiegwu ama ama bụ Wizkid, Davido na Tiwa Savage n'ihe ejiji ha ji akwado emume ụka ha chọrọ ime. Mgbe ndị otiegwu a chọpụtara aghụghọ a, ha were iwe ma gosipụta ya na ihe ha dep��tara na Soshal Midia ha . Lee ihe ejiji nke eji Wizkid na Tiwa Savage mee Tiwa Savage Wizkid Davido Ka ọ dị ugbu a, ndị COZA ewepụla ihe ejiji a ha mere, kama onweghị ihe ha kwurula maka ya. 2) Donald Trump Ndị ụlọomeiwu nke mba Amerịka emeela atụmatụ 'impeachment' nke kwuru na Trump emetela ihe ekwesiri iji chụọ ya dịka onyeisiala mba Amerịka. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisiala Amerịka nke atọ ndị ụlọ omeiwu tinyere akwụkwọ ka achụpụ n'ọkwa. 3) Sotitobire Church Ndị mmadụ gbara ụlọ ụka Sotitobire dị n'Akure ọkụ maka akụkọ ndị uweojii sị bụ asị na-efegharị na soshal midia. Okwu a malitere n'ọnwa gara aga mgbe amaritere chọwa nwatakịrị aha ya bụ Gold Kolawole furu n'ụlọụka ahụ. Dịka ọ dị ugbua, ogbaaghara ataala isi mmadụ abụọ nke bụ otu onye uweojii na onye nkịtị. Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buhari mere ncheta ọmụmụ ya n'ụbọchi 17 nke ọnwa Disemba a. Ozi nwunye ya bụ Aisha Buhari dere na Twitter butere ọtụtụ akụkọ. 5) Kamaru Usman Kamaru Usman bụ nwaafọ Naijirịa ma bụkwa onye ama ama n'egwuregwu 'MMA' meriri mgba ma ka bụrụkwa okaibe ji mgba n'ụkwụ nke ndị UFC. 6) 6 years single Term : Atụmatụ onyeisiala iji afọ isii chia otu mgbe. Ndị ụloomeiwu nta ewepụla atụmatu ime ka onyeisiala iji afọ isii chia otu mgbe. Otutu ha kagburu ya ma sị na onweghị ihe mere etu ọ dị ugbụ a. 7) Onwụ Benjamin Uwajumogu Benjamin Uwajumogu bụ onye na-anọchite anya Imo North na ụlọ sineti Naịjirịa nwụrụ n'ụbọchi nke asatọ n'ọnwa Disemba 2019. Ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naijirịa zitere ezinụlọ ya ozi itiakanobi. Otiegwu ama ama bụ Naira Marley wuru n'izu a ọkachasi maka egwu ọhụrụ a na-agba nke ọ kpọrọ Tesumole. Ihe ọzọ mere ka nwaokoroobia ji pụrụ onye akpụ n'ọnụ bụ egwu ohụrụ otipụtakwara n'izuụka nke ọ kpọrọ 'LOL- Lordoflamba'. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50866217 +health Coronavirus: Mgbachi ụlọ uka ga-emechi ụzọ ngozi na amara - Archbishop Chukwuma Onyeisi ụka Anglịkan n'Enugwu bụ Archbishop Emmanuel Chukwuma kowara uche ya banyere nkwụsi ụka maka ihi ọrịa coronavirus. Chukwuma si na ya agaghị agbachị ụlọụka kama ihe ya ga-akwado bụ ka ebelata ndị na-abịa ụka otu mgbe. Ọ sị na ọ bụ Chukwu nwe ụka, nke pụtara na imechi bụ imechi ụzọ ngozi na amara. Ọ bu ya na Ebere Ekeopara nwere mkparịtaụka a. Mana Bishọp chịburu Dayọsis Mbaise dị n'Imo steeti kwuru na ya kwadoro atụmatụ gọọmentị ịkwụsịtụ ndị mmadụ ịgbakọ n'ụlọụka. Bisho BJE Ogu kwuru na ụka kwesịrị inyere gọọmentị aka na mbọ ha na-agba iji chụlaa coronavirus. Gee ihe o kwuru: https://www.bbc.com/igbo/afirika-52081650 +sports Nigeria vs Cameroon: Naijiria egosila kameroon na Surugede abụghị egwu ụmụaka Super Eagles nke Naịjirịa ezila ndị Indomitable Lions nke Kameroon ihe ọkụ ji ntị oke e me site n'iji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie ha n'asọmpi Iko Afrịca. Kameroon gbara mbọ ha niile mana Naịjirịa kwechiri ka ajọ ọnwụ rue mgbe asọmpi a gwụrụ. N'ime nkeji 20 Odion Ighalo nke Naịjirịa wụnyere otu ọkpụ goolu iji sị ndị Kameroon 'unu abịala?' Agbanyeghi nke a, Kameroon na-akwanye Naịjirịa ọkụ n'ike nke mere ha ji saa goolu a site na goolu Stephane Bahoken nyere na nkeji 41. N'ime nkeji atọ nke a mechara, Kameroon sụnyere ọkpụ goolu ọzọ site n'aka Clinton N'Jie na nkeji 44. N'ọkara nke abụọ n'ime asọmpi a, Kameroon malitekwara ịcha Naịjirịa ọkụ di egwu dịka ha ka jiri bọọlụ n'ụkwụ karịa Naịjirịa. N'ime nke 64 Naịjirịa biliri n'ụra site na goolu Odion Ighalo nyere nke mere ya ọkpụ abụọ abụọ. N'erughi nkeji atọ, Naịjirịa mezuru ọkpụ atọ ha site n'aka Alex Iwuobi na nkeji 66. Naịjirịa etozuo oke n'agba anọ nke ikpeazụ asọmpi Total AFCON 2019. Onyeisiala Muhammadu Buhari e keelala ndị Super Eagle na mmeri ha meriri Kameroon. N'otu aka ahụ Atiku Abubakar kelekwara ha: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48896152 +entertainment """Ọ dịghị mma nwoke ịgwa nwunye ya ego ole ọ na-enwete"" - Blessing CEO" "Di na nwunye kwesiri ịbụ otu maka na ha bụ otu n'ime mmụọ ma n'eziokwu. Ha abụọ kwesịrị ịbụ ji na mmanụ, obi na ara dịka omenala na ụka siri kwekọrịta. Mana agbanyeghị ka ụtọ di na etiti nwaanyị na dị ya, ọ nwere ihe abụọ nwoke anwaghị anwa gwa nwaanyị ya. •Nwoke agaghị agwa nwunye ya onye ọ dịnara? Ọtụtụ umunwoke enweghịike ịgwa nwunye ha onye ọ na-edina maka na ha che na ọ pụrụ ịgbawa nwonye ha obi. Ụfọdụ ụmụnwoke chekwa na ịgwa nwunye ha onye ọ na-ara bụ ibute ọgbaaghara n'ezinụlọ ha. N'ihi nke a, nwoke agaghị achọ iji aka ya kotere onwe ya nsogbu sịte na-ikwu udiri okwu ahụ. Nke bụ eziokwu bụ na ụmụnwoke ndị ọzọ gana ele nwoke kwuru ụdị ihe ahụ anya ka ""onye nko"" (onyeamaghị ihe). Charles Mbamara bụ onye degoro akwụkwọ maka ọdịmma nwoke na nwaanyị sị na ịgwa nwaanyị ụdị okwu ahụ bụ sị ya ""kwara lii:"" (laa be ha). Ọ sị, ""nwaanyị ga na-asị gị, gwa m eziokwu, gwa eziokwu, ebe ọ na-ekpe ekpere ka ị ghara ịgwa ya. Mana ị mechaa gwa ya ihe ahụ mara na ""nke gị ekpome"" (nke gị agwụla). Mana otu nwaanyị bụ onye ọkachamara na mmekọrịta nwoke na nwanyi bụ Blessing Okoro sị na o nweghị ihe ọ mere nwoke ịgwa nwunye ya onye ọ rara. O kwuru na ọtụtụ ụmụnwaanyị anabatala ịgba na-ezi ụmụnwoke na mpaghara a nke bụ na ha anaghịzị ahụ ya ka ihe ọhụrụ maọbụ ajọ ihe. Ọ sị na nne na nna nwaanyị ahụ agaghị anabata ya n'ụlọ ha ma ọbụrụ na ọ lara maka na di ya gbara n'ezi. Ọ sị na ""ha ga-eji okpiri chụchie ya azụ"". Nwoke bụkwa ọkaibe na mmekọ nwoke na nwaanyị bụ Charles Mbamara, onye a na-etu Charles De La Romeo sị na ya so na ụmụnwoke na-ekweteghị na ọ dị mma ịgwa nwunye ha ego ole o na-enweta. O kwuru na nke a nwereike ibute mkparị n'aka nwaanyị ahụ maọbụ budaa ugwu ya. Mbamara sị ""nwunye gị ga-aka kwanyere gị ugwu ma ọ maghị ego ole ị na-enweta. Ọ sị na ọ ga-aka njọ ma ọ bụrụ na ha mechaa see okwu. Blessing Okoro kwenyakwara na ọ dịghị mma ịgwa nwaanyị ego ole ọ na-enweta agbanyeghị ka o si hụọ ya n'anya. Blessing sị na nke a ga-eme nwaanyị ọ na-ana dị ya oke ego. Ọ sị na "" ọtụtụ ụmụnwaanyị agaghị ezuike rụọ mgbe ọ hụrụ isi ego ọbụla di ya nwere"". Otu nwoke achọghị ka akpọọ aha ya na-ekwu na ""mgbe mụ na nwunye kacha adị na mma bụ mgbe ọ hụrụ na ego agwụla n'akpa m"". Ọ sị na nwunye ya agaghị akwụsị ịweta nsogbu ruo mgbe ọ hụrụ na ego ya agwụla kpam kpam. Nwoke ahụ sịkwa na ""mmehie m mere kacha ewute m bụ ịgosi nwunye m ego ole a na-akwụ m"". •Nwoke aga-agwa nwunye na ọ mụrụ nwa n'ezi? Charles Mbamara sị na nke ahụ bụ nwoke iji aka ya gbaara onwe ya ụgbọ nwamkpi. Ụmụnwoke ndị ọzọ sị na ụdị ihe a bụ ihe nwoke na na-agwa ụmụnna ka ha jiri ọnụ ha kwuo ya. Blessing sị na o nweghị ihe ọmere na nwoke mụrụ nwa n'ezi maka na ụfọdụ ụmụnwaanyị gana ahụ dị ha ka onye eziokwu maka nke a. Blessing sị na ọ dịghị mma nwoke ịgwa nwaanyị ya na o buru ibu maọbụ na ọ jọrọ njọ maka ụdị okwu ahụ nwereike ịgbu mmụọ ya. Mana Mbamara sị na ọnweghị ihe ọ mere mana ọ dabeere ka onye ahụ si kwuo ya. Ọ sị, ""nwoke dị otu a kwesiri iji olu ọma gwa ya nwunye ya. Onye dere akụkọ a: Chris Sanctus Chukwudi Okereke" https://www.bbc.com/igbo/58576135 +health Covid-19 Vaccines FAQ: Ajụjụ niile i nwere maka ọgwụ mgbochi covid-19 "N'ụbọchị abụọ nke ọnwa Maachi ka ọgwụ mgbochi si n'otu COVAX nakwa ụlọọrụ Astrazeneca tụrụ ụkwụ na Naịjirịa. Dịka ụbọchị ole na ole gara, onyeisiala Muhammadu Buhari nakwa osote ya bụ Yemi Osinbajo gbara ọgwụ ahụ n'ihu ala niile iji gosi na-onweghi ihe ọjọọ dị na ya. N'agbanyeghị nke a, ọtụtụ ndị mmadụ ka chị obi ha n'aka maka ọgwụ a ma na-atụ ụjọ maka ihe o nwereike ịme. Anyị edetuola ụfọdụ ajụjụ a ma za kwa ya iji kasie ndị mmadụ obi. Ụlọọrụ a kpọrọ National Primary Health Care Development Agency ewepụtala usoro ị ga-eji denye aha gị n'igwe kọmpụta. Ị nwekwara ịke ịhọrọ ebe ị chọrọ ị gba ya bụ ọgwụ nakwa ebe dị nso na be gị. Dịka ọ dị ugbua, ihe karịrị mmadụ nde abụọ edenyela aha ha ịgba ọgwụ a. Gọọmentị etiti akpọpụtabeghi ego ole ọ ga-ewe mmadụ iji nata ọgwụ mgbochi a. Kama ha kwuru ka ndị ọrụ ahụike nakwa ndị okenye na ndị ọrịa na-arịa gbaa mbọ hụ na ha wetara onwe ha ebe a na-agba ọgwụ a. Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garbe Shehu kwuru na o nweghi ihe ọbụla merela onyeisiala mgbe ọ gbachara nke ya. Mana gọọmentị mba Briten kọwara na o nwere ụfọdụ ngosi mmadụ nwereike ị nwe ga-ejikwa aka ya kwụsị n'ime otu izu Ha gụnyere: ike ọgwụgwụ,isi ọwụwa, ịgbọ agbọ, ịkọ ọkọ n'ebe agbara gị ọgwụ, ọkpụkpụ ịgbu mgbu, ahụ ọkụ ndz. Enwerem ike ibute ọrịa covid-19 ọzọ ma m gbachaa ọgwụ a? O dobeghi anya ma nke a enwereike ịme n'ezie mana ngalaba ahụike mbaụwa niile bụ WHO kwuru ka ndị mmadụ jide ka ha ji. Nke a pụtara ""kpuchie imi gị, kwọọ aka gị, dopu onwe gị iche ganye mgbe mpụtara ga-egosi na ọgwụ mgbochi achụlaala covid-19 kpam kpam. - Anaghị agba ụmụaka ọgwụ a - Ọgwụ mgbochi a enweghi nje coronavirus n'ime ya dịka akụkọ ụgha si kwuo. - Amabeghị ma ọ na-ekpuchi ndị mmadụ n'ebe ụdịrị ọhụrụ ọrịa a dị (d���ka mba UK na mba Saụt Afrịka)" https://www.bbc.com/igbo/afirika-56327058 +health Exercise for pregnant women: Ị dị ime? Zeere mmegharị ahụ ndị a. Oge nwaanyị dị ime bụ oge dị oke mkpa. Dịka ụfodụ ihe onyonyo n'ịntanetị na-egosi ebe ụmu nwaanyị di ime na-eme ihe mmegharị ahụ dị iche iche. Ndị okaibe maka ịdị ime etinyela ọnụ ma nye ụmụ nwaanyị ndụmọdụ maka mmegharị ahụ ziri ezi oge ha dị ime. https://www.bbc.com/igbo/afirika-56791907 +sports Boxing Day: Southampton akụọla Chelsea ihe Anthony Joshua kụrụ Ruiz Taa bụ 'boxing day' adịghị ndị Chelsea mma n'ahụ dịka ndị Southampton kụwara ha anya n'azụ owere ha. Ndị Southampton ji ọkpụ goolu abụọ gbarie 'Stamford Bridge', gbanye ndị Chelsea ose n'anya. Nwafọ Naịjirịa bụ Michael Obafemi bụ onye buru ụzọ gbakaa neetị na nkeji 31. Obafemi, onye gbara naanị afọ 19 bụ mba Ireland ka ọ na-agbara. Na nkeji 73, Nathan Redmond mezuru ya abụọ wee mee ndị Chelsea otiwere anya ahụ ụzọ. N'aka nke ọzọ, Mikel Arteta malitere ije ya dịka onye nkuzi ndị Arsenal taa, mana o nwetaghị mmeri. Arsenal na ndị Bournemouth gbara onye lawa onye lawa. Dan Gosling nke Bournemouth nyere goolu na nkeji 35, mana Pierre Emerick Aubameyang sara ya na nkeji 73. Arteta ga-eji nke a mata na ihe chere ya n'ihu n'otu egwuregwu Arsenal abụghị ọgụ nne na-agbara nwa ya. Ọkpụ goolu anọ asatara otu ka ndị Manchester United ji tie ndị Newcastle mmọnwụ. Marcus Rashford, Mason Greenwood na Anthony Martial nyere goolu anọ ahụ. Martial nyere goolu abụọ ebe Matty Longstaff nyetaara ndị Newcastle otu goolu. Ihe kacha tọọ ndị Man Utd ụtọ n'egwuregwu nke taa bụ na Paul Pogba alọghachila. Pogba agbabeghi bọọlụ ogologo oge n'ihi ahụ o merụrụ. Mana Carlo Ancelloti ji mmeri wee malite ọchịchị ya n'Everton. Everton ji otu ọkpụ goolu merie Burnley. Crystal Palace jikwa ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie West Ham, ebe Aston Villa meriri Norwich 1-0. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50920134 +entertainment #FaintingDanceChallenge: Ọ bụzị ịma aka ka ụmụ Naịjirịa ji biri? "Ufodụ ụmụ Naijiria na bụ ụgbọ ọbụla gaferela, ha soro ya gawa. Nke a gụnyere ị ma aka dị iche iche wurulanụ ma gafee na etu o si metụta ụfọdụ ụmụ Naịjirịa. Anyi ga-ebido na nke na-ewu ugbua akpọrọ ""#IdibalaChallenge"" Ọtụtụ mmadụ na-akpọkwa ya ""Fainting dance"" bụ egwu na-eme ka ndị mmadụ dinaa ka ndị kụbiri ume ebe ọ bụla ha hụrụ onwe ha ma egwu so ya na-akpọ. Ụfọdụ na-edina na mmiri maọbụ na okporoụzọ. Kamgbe ọ pụtachara, ụfọdụ ụmụ Naịjirịa ṅomiri ya ma tinye ya na soshal midia ka ụwa kirie. Ọ bụkwa otiegwu onye mba South Afirịka akpọrọ King Monada tiri egwu a. O kwuru na ọ bụ maka obi enyi ya nwaanyi gbawara mere o ji arịa ọrịa ndatu n'egwu ahụ. Aha Egwu a bụ Malwedhe. #KupeChallenge Kamgbe ụmụ okorọbịa anọ si na mba France wepụtachara ihe onyoonyo ebe ha na-agba egwu ""Kupe,"" social midia nwuuru ọkụ. Kupe bụ egwu otiegwu si mba Ghana akpọrọ Ebonyi tiputere. Mana ndị mmadụ na-ekwu na ihe mere egwu ụmụ okoroọbịa a ji pụọ iche bụ na ha bụ onu gbajie ""ụmụ nwaanyị."" Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa ji akara akpọro #KupeChallenge wee gbawa egwu a ụmụ okorọbịa gbara. Nke a mere ka ụmụ okorọbịa a gbara Kupe wuchie na Naịjịrịa. Ọzọkwa kopuru mba ụwa bụ #KikiChallenge#InMyFeelingsChallenge Ị maka aka a bụ ebe mmadụ ga-esi na ụgbọala ya ka na-aga n'ụzọ wụpụ gbawa egwu. O bidoro wube na soshal midia n'ọnwa July nke afọ 2018. Ọ bụ otiegwu ama ama na Kanada tiputere egwu a mana ọ bụghị ya mere ka ndị mmadụ were ya na-eme ị ma aka. Otu onye na-eme ihe nkiri ama ama na mba America bụ Will Smith mebigara nke ya oke. Lekwa nke nwata nwaanyị a: #MannequinChallenge N'afọ 2016, ụmụ akwụkwọ mba Amerika bidoro ị kwụ ka nwa bebi eji akpọsa ahịa akwa ma egwu na-eti. Ọtụtụ mmadụ pụtara mewe ihe a tụmmadị na Naịjirịa. #MannequinChallenge bụ okwu eji mara ya na internet mgbe ahụ. Onweghị ihe achọpụtara na ọ bụ maka ya ka eji wepụta ya bụ ịma aka . Ndị mmadụ na-eche na ọ bụ maka ịkpaọchị ka ndị mmadụ ji eme ya mgbe o wuru. Ndị dịka Hillary Clinton, nwunye onye chiburu Mba Amerika bụ Michelle Obama so na ndị mere ya bụ ịma aka mgbe owuru na soshal midia. #IceBucketChallenge Ihe ọzọ wuru ewu na soshal midia ndị dịka ome ihe nkiri bụ Genevive Nnaji mere bụ nke akpọrọ ""Ice Bucket Challenge"". Ndị mba Amerika wepụtara ihe a ka ha wee mee ka ndị mmadụ mara maka ọrịa agwọta agwọta bụ ""Amyotrophic Lateral Sclerosis"" na-eme na be ha n'afọ 2014. Mana ọtụtụ ụmụ Naịjrịa ga buru ya n'isi. Ndị ama ama so mee ịhe a gụnyere aka chiburu Mba America bụ George W. Bush, Mike Zuckerberg, Don Jazzy, Davido, Ice Prince nakwa ndị ọzọ. @davidoofficial mere nke ya. Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ dịka ha na-eche ka ịma aka pụta ka ha were ya na-eme ihe ịkpaọchị. Ọnye ma nke ga-fịọ ọzọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/46303153 +entertainment Lilian Esoro sị na akụkọ na ọ dịrị Blossom Chukwujekwu ime na-atọ ọchị "Lilian Esoro bụ onye e ji ime ejije na Nollywood mara sị na o nweghị ihe ọbụla o nwere ikwu maka ebubo ịnara mmadụ di ya e boro ya. Onye mbiputa akụkọ bụ Stella DimokoKorkus dere sị na Esoro dị ime nwa onye ejije ibe ya bụ Blossom Chukwujekwu. Mana esoro gwara BBC Igbo n'ekwentị sị na ọ gaghị ekwu ""pịm"" maka okwu ahụ makana e nweghi okwu dị ya. Kama n'elu ihe a na-akpọ ""Instagram story"" ya na soshal midia, o dere sị ""e kelekwaa m unu"" ma na-achị ezigbo ọchị. N'otu aka ahụ, BBC Igbo gbalịrị inweta Chukwujekwu n'ekwentị nke ya mana o bulighị ya, mana o tinyere foto ebe ọ na-achị ezigbo ọchị n'elu Instagram ya ka aha ya na-efegharị. Kedụ ihe butere akụkọ a? Dimokokorkus e ji 'SDK 'mara dere akụkọ na Chukwujekwu akwarala ngwongwo ya si n'ụlọ ya na nwunye ya bi kemgbe afọ 2016 ha lụrụ, kwapụ. O kwuru na nke a mere makana Esoro dị ime nwa ya. Okwu si n'ime ya pụta: Ndị mmadụ malitere ịkpa maka Esoro na Chukwujekwu makana ha bụ ndị na-ewu ewu. Aha ha malitere iwu n'elu Twitter, ebe ụfọdụ na-ekwu na ọ pụtara na Esoro nwere obi ime nwaanyị ibe ya ụdịrị ihe ya na onwe ya gabigara oge ọ lụburu Ubi Franklin. @barbie_juliet04 kwuru na o che na enweghi ihe ga-esenwu okwu n'etiti Chukwujekwu na Maureen nwunye ya. @ehte_ na-ajụ etu Esoro si hapụ di ya maka ụdịrị ihe a wee soro di mmadụ. @tascaramel2 kwuru sị na ebe ọ bụ na Esoro nwere obi ime nwaanyị ihe a, na ọ maghịzị anya ọ ga-eji na-ele ndị mmadụ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49612847 +politics US Presidential Debate 2020: Ihe mere na nrụrịtaụka Donald Trump na Joe Biden "Dịka Donald Trump na Joe Biden na-azọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka mere nrụrịtaụka maka ntuliaka a ga-eme n'ọnwa Nọvemba, lee ihe ndị ị kwesịrị ịma. Trump na-azọ ọkwa a n'okpuru pati Republicans ebe Biden na-azọ n'okpuru Democrats, nke a bụ mbụ ha abụọ na-ezute na nrụrịtaụka. Chris Wallace bụ onye ntaakụkọ n'ụlọọrụ Fox News chịkọtara emume a e mere n'abalị Wenezde, Septemba 30. N'etiti Trump na Biden, isiookwu a kacha rụtụ aka bụ Covid-19, akụnaụba obodo, ihe gbasara agbụrụ, mpụ nakwa ihe gbasara ugwu ntuliaka. Ha dụkwara onwe ha aka n'ọnụ banyere ezinaụlọ ha, dịka Trump dụkwara Wallace chịkọtara ya aka n'ọnụ. Wallace gwara Onyeisiala Trump ka ọ kwụsị imebi iwu e tinyere maka ya bụ nrụrịtaụka. Wallace ji ihe gbasara onye ga-anọchi Ọkaikpe Ruth Bader Ginsburg nwụrụ anwụ dịka Ọkaikpe kachasị n'ụlọikpe etiti bido ya bụ nrụrịtaụka. Gbasara ahụike Biden kwuru na ndị mmadụ ekwesịghị ịtụnyere Trump n'ihi na ọ na-agbasi mbọ ike ịhụ na ọ wepụrụ enyemaka gọọmentị na-enyere ndị mmadụ ịkwụ ụgwọ ahụike. Ọ katọkwuru etu Trump si ebuso mkpa mkpa Covid-19 agha na mba Amerịka, ebe Trump turu ọnụ na akụnaụba obodo na-etolite kemgbe ọ banyere ọchịchị ma kwe nkwa na ọ ka ga-eto na-aga n'agbanyeghi na Covid-19 metụtatụrụ ya. Wallace kwuru na n'ime afọ atọ mbụ Obama na Biden chịrị, na mba Amerịka kewapụtara ọrụ karịa ole Trump kewapụtarala n'ime afọ atọ mbụ ọ chịrịla. Trump tinyere ọnụ sị ya ""Ọ bụ ntolite kacha akpụ akpụ kemgbe afụ 1929"". Biden kwuru na ezigbote ahụ adịghị akụnaụba mba Amerịka mgbe ha banyere ọchịchị n'afọ 2009, mana ha kwalitere ya nke ọma tupu ha apụọ. Biden katọrọ Trump n'ihe gbasara akụnaụba obodo, dịka o boro ya ebubo itikpọ akụnaụba Barack Obama hapụrụ mgbe ọ chịchara. Trump na onwe ya kwuru sị na ihe ọ ma bụ na o weghachịtara ọrụ ruru 700,000. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na Biden merie, na akụnaụba mba Amerịka ga-akpụ afọ n'ala. Wallace jụrụ Trump: ""Ọ bụ eziokwu na ị kwụrụ narị dọla asaa na iri ise ($750) n'ime otu afọ dịka ụtụisi a na-akwụ gọọmentị etiti n'afọ 2016 na 2017?"" Trump sara ya sị ""A kwụrụ m nde kwuru nde dọla, a kwụrụ m nde dọla iri atọ na asatọ ($38m) n'otu afọ, kwụọ nde dọla iri abụọ na asaa ($27m) n'otu afọ."" Biden gwara Trump ya gosi ndị mmadụ etu o si akwụ ụgwọ ụtụisi ya, ebe Trump sara Biden sị ""Ị ga-ahụ ya mgbe ọ gwụrụ"" - n'ihi na a na-enyocha ya. Mana iwu ekwughi na ọ gaghị egosiputanwu ya ugbua. Wallace jụkwara ya ọzọ sị ""Ị ga-agwa anyị ego ole ị kwụrụ n'ụtụisi gọọmentị etiti n'afọ 2016 na 2017?"", nke Trump sara sị ""nde kwuru nde dọla, ị ga-emecha hụ ya."" Ọ gara n'ihu gwa Biden na ọ bụ iwu ụtụisi ha tinyere oge ọchịchị ha mere ka ndị dị ka ya na-erite ụdịrị uru a. Ebe Biden sara ya sị na ụtụisi Trump tinyere dabaara naanị ọgaranya, na ọ ga-ewepụ ha ma ọ bụrụ na o merie, ma tinye ya n'inyere ndị chọrọ enyemaka aka. Mara na ndị osote ha bụ Mike Pence nke Trump na Kamala Harris nke Biden, ga-eme nrụrịtaụka nke ha n'ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba." https://www.bbc.com/igbo/afirika-54352095 +entertainment Chimamanda Adichie bụ onye nke anọ olu ya ka ada ụda n'Afrịka Ada Igbo a ma ama bụ Chimamanda Ngozi Adichie bụ onye nke anọ na ndị kacha nwee agba n'Afrịka niile. Nke a bụ dịka akwụkwọ akụkọ 'The Africa Report' si depụta. Akwụkwọ a deturu aha mmadụ otu narị bụ ndị ha sị na okwu ha na-ada ụda n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, iji ego achụ ego, nakwa nka. Naanị Adichie bụ nwanyị aha ya dị na aha iri e bu ụzọ depụta na ya bụ akụkọ bụ ndị Afrịka ji biri. Onye nke mbụ aha ya gbara n'akụkọ ahụ bụ Aliko Dangote, nwaafọ Naịjirịa kacha baa ọgaranya n'Afrịka niile. Ndị ọzọ bụ Elon Musk, Koos Bekker nakwa Trevor Noah ndị mba Saụt Afrịka. Adichie bụ nwaafọ Igbo e ji ide akwụkwọ mara. Ihe ọzọkwa e ji mara ya bụ ịkwalite ikike ụmụnwanyị. Adichie deela ọtụtụ akwụkwọ ma nyekwa ọtụtụ nkuzi n'ebe dị icheiche gbasara ụmụnwanyị, Naịjiria nakwa Afrịka. Ọ bụkwa onye ihe gbasara asụsụ na omenala Igbo na-anụ ọkụ n'obi mgbe niile. BBC Afrịca Eye anwụdela onye nkuzi mahadum Legọz ahụ na-atọ bịrịbịrị, na-anaghị ekwe ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. Ugboro ugboro ka ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị na mahadum na-ekwu na ndi nkuzi ha na-enye ha nsogbu iji dinaa ha. Mana mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ anaghị ekwetacha ihe ha na-ekwu Mana aka akparala ezekudele, ọ ga-ekwuzi mmụọ chiri ya ọzọ. A ka na-achọ ụmụakwụkwọ sekọndịrị nke Engravers College na Kaduna bụ nke ndị ntọrị nwụụrụ kamgbe abali anọ gara aga. Akụkọ na-ekwu na ndị ntọrị ahụ na-akpọ aha ego iji hapụ ụmụakwụkwọ ahụ mana ndị uweojii Kaduna steeti sị na ha na-anwa oke ha ịchọta ha. Cheta na ndị ntọrị wakporo ụlọakwụkwọ ahụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Tọọzde, abalị atọ nke ọnwa Ọktoba, ma tọrọ ụmụakwụkwọ isii na ndị nkuzi abụọ. Gọọmentị Kaduna kwekwara nkwa na ha ga-eme ihe niile ha nwere ike ịchọta ndị ahụ a tọọrọ. Okwu gbasara nchutu onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-arịwanye elu gbasara mkparịtaụka ya na onyeisiala mba Ukraine nwere n'ekwe ntị oge gara aga. Ugbua, ha adịla mmadụ abụọ bụ ndị na-ebo Trump ebubo agwa ọjọ gbasara ya bụ mkparịtaụka. Mana Trump ka na-esi ọnwụ na onweghị ihe ọjọọ o mere. Ndị mmadụ ka kpụ Mercy n'ọnụ n'ihi mmeri o meriri n'ihe omume Big Brother Naija, mana ihe ukwu mekwara na Doha na mba Qatar. Ese Brume, riteere Naịjiria ola mbụ nke egwuregwu 'athletics championship' bịara n'isi njedebe ụnyaahụ mgbe o nwetara ọla nchara n'asọmpi 'Long jump'. Nke a bụ naanị otu ọla Naịjirịa nwatara na ya bụ egwuregwu 'International Association of Athletics Federations' IAAF. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-49957918 +entertainment Jim Iyke and Uche Maduagwu: Ugboro ise ndị a ma ama jiri ịtụ asị rafuo ọha na soshal midia Ọtụtụ ndị a ma ama na Naịjirịa nakwa na mbaụwa emela ihe ndị mmadụ ji akpụ ha n'ọnụ ụfọdụ oge. Ụfọdụ ha na-akpacha anya mee ihe ga-eme ka ha bụrụ isiokwu nkata ndị mmadụ. Ụfọdụ oge ọ na-adabara ha mana ụfọdụ oge ndị ọzọ, ọ na-aghọ ha ahịa ma a chọpụta na ihe ha mere maọbụ kwuru abụghị eziokwu. Akụkọ a na-achịkọtara gị ugboro ise ndị a ma ama na Naịjiria tụrụ asị wuru ewu na soshal midia tupu e mechaa chọpụta na ọ bụ asị. Ndị a ma ama tụrụ okpotokpo asị wuru ewu 1. Jim Iyke Jim Iyke bụ otu onye welitere isi na ndị ejije Naịjirịa a kpọrọ Nollywood. O meela ọtụtụ ejije dị icheiche ebe ọ bụ onye isi nkụka nke mere na ndị mmadụ na-eche na ọ dị etu ahụ n'ihe. N'ọnwa Ọgọst afọ 2021, ihe onyonyo pụtara na soshal midia ebe ọ dịka ọ na-emepụta ihe ọ na-eme n'onyonyo dịka onyeisi nkụka. Onyonyo ahụ pụtara gosiri ebe ọ na-eti Uche Maduagwu bụkwa onye na-eme ejije ihe n'ihi mkparị ọ sị na ọ kparịrị ya. Maduagwu bụ otu onye na-emekwa ejije a ma ama dịka onye na-akatọ ndị mmadụ na soshal midịa. O kwuola ọtụtụ ihe dị icheiche megide mdị mmadụ nke ndị mmadụ ji akpụ ya n'ọnụ ọtụtụ oge. Uche Maduagwu bupụtara akụkọ na soshal midia na-atụ Jim Iyke aka ka ọ kọwaa ebe ego ya si. O kwuru na Jim Iyke na-eme okomuko karịa etu o siri kwesi, na-atụ aka na ọ bụghị naanị ejije na-enye Jim Iyke ego, kama ka Iyke kọwara ọha ebe o si enweta ego ọ na-akwari na soshal midia. Madụagwu kwuru a ya onwe ya na-emekwa ejije mana ya anaghị ahụ maọbụ egosipụta ego etu Jim Iyke si egosi ya. Ọ na-ajụ ma 'ọ bụkwa ejije a ya na-eme ka Jim iyke na-eme jiri na-egosi ego niile a na soshal midịa.' Okwu ya ahụ amasịghị jim iyke chacha nke mere na o rughi ụbọchi ole na ole Maduagwu kwuchara ihe ndị a na soshal midia, onyonyo apụta ebe Jim Iyke wakporo ya iti ya ihe. Ọ dịkwa mkpa ịmata na Jim Iyke wepụtara ihe ejije ọhụrụ oge ahụ ọ kpọrọ 'bad comments'. Ejije ahụ bụkwa maka ndị na-anọ na soshal midịa akọ ndị mmadụ ọnụ ma na-ekwutọ ndị mmadụ. Nke a mere o jiri ọ gbagwojuo ndị mmadụ anya ka ọ bụ ejije ya ka ọ na-akwado mere o jiri wakpoo Maduagwu. BBC Igbo gbara Jim Iyke ajụjụọnụ oge ihe a mechara ịma ka o tiri Maduagwu ihe n'ezie, Jim Iyke kwuru na ọ bụghị n'ihi ejije ahụ o wepụtara (bụ nke gbasara iburu ọgụ gakwuru ndị na-akparị mmadụ na soshal midia) ka o ji tie Maduagwu ihe. N'ihe dịka ntụgharị ihe mere, oge ndị mmadụ dịka ha echefuola maka mwakpo ahụ mere, onyonyo ọzọ pụtara n'abalị ise nke ọnwa Jenụwarị 2022 ebe Jim Iyke na-ekwu na e tiri ihe e tighi ihe bụ nghọgbu ka ha ghọgburu ndị mmadụ. Jim Iyke kọwara na ya na Maduagwu nọrọ ala kpaa nkata maka etu ha ga-esi ghọgbuo ọha, iji kwalite akụkọ gbasara ya bụ ihe onyonyo ya ahụ. Uche Maduagwu n'onwe ya kwuru na ihe ahụ niile bụ iji kwalite onyonyo ahụ dịka jim Iyke kwụrụ ya ihe karịrị nde naịra anọ iji kwalite onyonyo ahụ. Nke a abụghị mbụ Uche Maduagwu na-eme ụdị ihe a mere e ji enyozi ya enyo oge ọbụla o mere ihe. 2. Blessing Okoro (Blessing CEO) Blessing Okoro Nkeiruka nke e ji Blessing CEO mara wuru ewu n'afọ 2019 mgbe ọ gwara ndị mmadụ na ọ rụrụ nnukwu ụlọ mara mma n'Enugwu bụ isi obodo Enugwu steeti na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Okoro bụ onye a ma maka ikuziri ndị mmadụ gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị, kwuru na o ji okwute ahụhụ a tụrụ ya mgbe ọ nọ na di, wuo ụlọ ya. Blessing na di ya gbasara alụmdi ha nke Blessing kwuru na mgbasa ahụ zọrọ ndụ ya. O kwuru na mgbasa alụmdi ahụ mere ya ji jiri ọsịịsọ na ọbara ya rụọ ụlọ ya iji mechapụta onwe ya ihu. Oge Blessing mere ncheta ọmụmụ ya nke afọ 30, o sere foto n'ihu ụlọ ahụ o kwuru bụ nke ya tinye n'Ịnstagram dee na ọ bụ onyinye ya nyere onwe ya na ncheta ọmụmụ ya. Mana ebe nsogbu dị bụ na ụlọ ahụ o gosiri abụghị nke ya n'ezie, ọ bụ ụlọ onye achụmntaego Igbo bi na mba Chaịna aha ya bụ Onye Eze. Mgbe foto ụlọ ahụ zuru ịntanetị niile, ndị mmaọ̄ụ malitere ịkpọpụta Blessing na ụlọ ahụ abụghị nke ya. Akụkọ kwuru na ọ bụ nwanne Onye Eze bụ onye buru ụzọ tipu mkpụ na ọ bụ ụlọ nwanne ya nwoke. Agbanyeghi nke a, Blessing gara n'ihu na-ekwusi ike na ụlọ ahụ bụ nke ya. O gbughi oge ihe ndị a na-eme, foto apụta gosi ebe a nwuchiri Blessing tụọ ya ịga n'aka dịka onye nwe ụlọ ahụ kwuru na ọ bụ ulọ ya ka Blessing ji eko na soshal midịa. Foto a gosiri Blessing ebe ọ gba ịga n'aka ụbọchị onye nwe ụlọ bụ Onye Eze chọpụtara ya maka itinye ụlọ ahụ na-abụghị nke ya na soshial midịa. Akụkọ kwuru na ndị otu Onye Eze nwuchiri Blessing ma tie ya ihe tinye ya na soshal midia nke mere e ji kpụrụ ya n'ọnụ. Blessing mechakwara rịọ ka ndị na-akwado ya gbaghara ya n'agwa ahụ ọ kpara. 3. Halima Abubakar Halima Abubakar bụ onye na-eme ihe nkiri na Naịjirịa tinyere foto nwata onye ọcha a mụrụ ọhụrụ n'Instagram n'afọ 2020. Oge a ka akụkọ pụtara na ya bụ nwaanyị na-eme ihe ejije na Nollywood mụrụ nwa ọhụrụ. Foto a bọliri uzu maka ọtụtụ ndị mmadụ chere na o tinyere ya iji kwụpụta na ọ mụọla nwa ọhụrụ n'ezie. Mana nsogbu dapụtara oge nwaanyị a kpọrọ Ariel bụ onye Amerịka kwuru na foto Halima tinyere bụ foto nwa ọhụrụ ya bụ Ariel. Nwaanyị gbadosiri ụkwụ ike gwa Halima ka o kwụsị ụdị omume ahụ ma wepụ foto nwa ya n'Ịnstagram ya. Halima mechara rịọ ndị na-eso ya mgbaghara ma wepụ foto ahụ. O depụtara ozi n'akara ya na soshal mịdịa kwuona ihe kpatara ya jiri mee ụdịrị omume ahụ bụ maka na ya esebeghi nwa nke ya foto kama na ya mụrụ nwa ọhụrụ n'ezie. 4. Harrysong N'otu aka ahụ, otiegwu a ma ama na Naịjirịa bụ Harrison Tare Okiri nke e ji aha egwu ya Harrysong mara gosiri foto ụmụejima abụọ n'akara ya n'Instagram n'afọ 2017. Foto ahụ wuru ewu nke ukwuu nke bụ na ọtụtụ ndị mmadụ zigara ya ozi ekele maka ụmụ ọhụrụ ya. O kwuru na ọ bụ enyi ya nwaanyị bi Abuja oge ahụ mụọrọ ya ejima nwoke na nwaanyị aha ha bụ Perez na Tare. Mana e mechara nke ahụ bụrụ asị ọcha. N'ọnwa Jenuwarị afọ 2022, ọ gwara ndị na-eso ya na nwa nwaanyị ọhụrụ bụ Daviva nke nwunye ya mụrụ bụ nwa mbụ ya. N'okwu ahụ o depụara n'akara ya, Harrysong dere 'abụghị papa ejima. O nweghi ejima ọbụla dị, o nwebughị mgbe ejima dị. Nwaanyị ahụ amụghịdị nwa cha cha. ọ tụrụ asị na-eri ego m. Nwa mbụ bụ Daviva.' BBC Igbo chọpụtara na Harry Song, Halima Abubakar na Blessing Okoro CEO ewepụla ebe ha gosipụtara ihe ndị a na soshịal midịa. https://www.bbc.com/igbo/afirika-59892625 +entertainment Osinachi Nwachukwu's Twin Sister: A nọ m n'anyammiri ụbọchị Osinachi na di ya gbara akwụkwọ - Ejima Osinachi Nwachukwu "Dịka ụwa niile ka na-eru uju Osinachi Nwachukwu, bụ onye a ma ama na-eti egwu ụka, ejima ya bụ Amarachi Eze agwala BBC Igbo na ihe niile a ka dị ya ka na nrọ. O kwuru na ya ekwetabeghị na nwanne ya nwaanyị anwụọla n'ezie, mana ihe niile dị Chukwu n'aka. Amarachi kwuru na Peter Nwachukwu bụ di Osinachi kpasoro ya ezinụlọ ha nnukwu agwa ọjọọ oge nwanne ha nwaanyị dị ndụ. ""Ihe mbụ Peter Nwachukwu mere gbawara m obi bụ oge ya na Osinachi na-agba akwụkwọ."" ""Ebu m Osinachi ụzọ lụọ di, ọ bụ ya kpooro m akwa n'ụbọchị agbamakwụkwọ m, o kwere m nkwa na ọ bụ m ga-ekporo ya akwa n'ụbọchị nke ya."" ""Mana di ya bụ Peter Nwachukwu fooro ntutu ya taa sị na nke ahụ agaghị eme."" ""N'ụbọchị agbamakwụkwọ Osinachi, ọ bụ onye ọzọ kpooro ya akwa, mụnwa anọrọ n'akụkụ na-ebe sọ akwa."" BBC agbalịala ugboro ugboro ịnụ n'ọnụ Peter Nwachukwu mana ọ mịtabeghị mkpụrụ. Anyị kpọrọ ekwentị ya mana ọ zaghị, anyị zigakwaara ya ozi ekwentị, mana ọ zaghachighi n'agbanyeghị na o gosiri na a gụọla ozi ahụ. Amarachi kọkwara ọtụtụ ihe ọjọọ o kwuru na Peter Nwachukwu mere ya onwe ya. O kwukwara na ọ naghị ekwe ka ndị ezinụlọ ha ọbụla rute nwanne ha nwaanyị bụ osinachi nso. Ọ gakwara n'ihu kwuo na Osinachi anaghị ekwe ka ha kọtara onye ọzọ ihe ọ na-agabiga n'aka di ya bụ Peter Nwachukwu. Cheta na Osinachi Nwachukwu nwụrụ n'ọdị nso a dịka ọ rịachara obere ọrịa. Akụkọ bu ụzọ pụta bụ na ọ bụ ọrịa kansa ka Osinachi rịara tupu ọ nwụọ. Mana ọ bụ oge ọ nwụchara ka kepukepu pụtawara na di ya na-emekpa ya ahụ, ma na-eti ya ihe kwa mgbe kwa mgbe. Ndị uweojii ekwuola na ha anwụchiela nwoke ahụ bụ Peter Nwachukwu ma malite nnyocha gbasara ebubo ahụ. Oge ọ dị ndụ, Osinachi Nwachukwu bụ onyeisi ukwe n'ụlọụka Dunamis International dị n'Abuja. Onyeisi ụlọụka a bụ ụkọchukwu Paul Enenche apụtala kwuo na ya amaghị na Osinachi gabigara ụdị ihe dị etu ahụ n'aka di ya bụ Peter Nwachukwu. Enenche kọwara na Osinachi gwara ya na ọ bụ obi mgbu na-eme ya, nke mere o ji ziga ya ụlọọgwụ maka ịnata ọgwụgwọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61104547 +politics Imo State: Ndị niile Rochas Okorocha nyere ala na Ekwema Crescent gba aka "Gọọmentị Imo steeti eforola ntutu taa na ha ga-anapụta aka chịburu steeti ahụ bụ Rochas Okorocha ala nakwa akụnụba niile o ji aka ike weghara oge ọ nọ n'ọchịchị. Gọvanọ Hope Uzodinma kwuru na nke a ihe ha kwekọrịtara n'ọgbakọ ndị isi gọọmentị nwere n'Imo steeti n'ụbọchị Tọzde. Gọvanọ Uzodinma kwuru na ụlọikpe enyela ha ikike ijichi ihe gọọmentị niile Okorocha weghaara n'ụzọ ezighị ezi. Lee ọkpụrụkpụ ihe Uzodinma kwuru na ha kwekọrịtara n'ọgbakọ ahụ: Ụlọikpe ukwu dị n'Owerri enyela iwu ka e jichie nwa mgbe nta ụfọdụ akụnụba bụ nke gọọmentị Imo steeti na-ebo ebubo na aka chịburu steeti ahụ bụ Rochas Okorocha nwetara n'ụzọ n'ezighi ezi n'iwu. Ọkaikpe Fred Njemanze nyere iwu a n'ụbọchị Tọzde dịka o kpebiri ikpe gbasara akwụkwọ gọọmentị Imo steeti gbara Rochas Okorocha site n'aka ọkaiwu Louis Alozie. Mkpebi a ọkaikpe Njemanze nyere bụ ụdị nke bekee kpọrọ 'ex-parte order', nke pụtara na onweghị ọkaiwu Rochas Okorocha nọ ebe ahụ ikwuchitere ya ọnụ ya oge e kpebiri ya bụ ikpe. Mana ọkaikpe Njemanze nyere ohere ụbọchị olemole ka onye nwe akụnụba ndị ahụ bịa kọwaa onwe ya, emeghị otu a, gọọmentị Imo ga-eweghara ha kpam kpam. Dịka ụlọntaakụkọ Channels na The Cable si dee, akụnụba ndị ahụ gụnyere ala nakwa ụlọ dị na mpaghara dị icheiche n'Imo steeti, nke gọọmentị kwuru na Okorocha ji aka ike nakwa ụzọ nrụrụaka weghara ha oge ọ bụ gọvanọ. Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma ekwuola na o nweghị aka na nsogbu dakwasara Rochas Okorocha mgbe ya na ndị otu ya gara n'ụlọ gọọmenti machiri. O kwuru nke a mgbe ọ gara ikele onyeisiala Muhammdu Buhari maka nkwado o nyere ya na mbọ ọ na-agba iji weta udo n'obodo ọrlu dị na steeti ya ebe enwere ọgbaghara nso nso a. Uzodimma kwuru na ọ bụ n'ọchịchị Ihedioha ka e hibere ọgbakọ ndị ọrụ ụlọikpe na steeti ya bidoro inyocha ebubo gbasara ala a nara ndị mmadụ n'ike ma nke e kwuru na ndị mmadụ were ala gọọmenti mere nke ha. O kwuru na ka ndị ọrụ ụlọikpe ahụ nwechara nzụkọ, ha kwetere ka amachie ụfọdụ ụlọ arụrụ n'ala ndị a a na-ekwu maka ya, nke ma gọọmenti Imo steeti kwenyere na ya. O kwuru na ọ bụ ndị ngalaba ọ bụ ọrụ ha imachi ụlọ ndị ahụ na-arụ ọrụ ha. ""Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ahụ mma ya ga ụlọikpe makana ihe gbasara ọchịchị abụghị ihe e ji egwu egwu."" Gọọmentị Imo steeti esila n'ọnụ Enyinnaya Onuegbu na-elekọta ala na steeti ahụ zaghachi ebubo nke onye bụbu Govanọ bụ Rochas Okorocha boro ha. Onuegbu kwuru na iwu obodo bụ iwu obodo nke agaghị agbanwe maka onye ọbụla nakwa na ihe dị ya mkpa bụ ọdịmma ndị Imo niile. Ọ gbara ama nke na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere iji nụ olu ya maka nwuchi anwụchiri Okorocha. ""O rụọla otu izuụka kemgbe anyị gbachiri ụlọoriri ahụ tupu Okorocha na ndị otu ya abịa gbaka ụzọ ebe ahụ"" ka o kwuru. Lee ihe o kwuru n'uju ebe a Rochas Okorocha bụbu aka na-achị Imo steeti ekwuola na onye nọ n'ọkwa ahụ ugbua bụ Hope Uzodmimma echezọọla ka o si bata otu APC O kwuru nke a dịka ya na BBC Igbo na-enwe mkparịtaụka n'ekwentị gbasara nwụchi anwụchiri ya n'Imo steeti ụnyaahụ. Ọ kọwara sị na ọ bụ ndị ụweojii nke Gọvanọ onwe ya ji aka ya hazi na ndị akpụ obi bụ ndị lụsoro ndị nke ya ọgụ ma gbaa ha egbe ma kụwaa ha isi. Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru na mkparịtaụka ahụ. Ndị uweojii kwụ ebe ahụ gbachị nkịtị dịka ihe a niile na-eme ma mechaa kpọzịa ndị uweojii ọzọ ha bịa nwụchie m. Ihe kachasị tụ m n'anya bụ na ndị uweojii kwụ ebe ahụ ka ihe ndị a na-eme. Ọ bụghị eziokwu na o ji ego gọọmentị rụ ụlọoriri ahụ, Ha eburu la okwu a gaa EFCC na ebe ndị ọzọ Mgbe Uzodimma hụrụ na o nweghi isi, ọ tụgharịa sị na ebe arụrụ ụlọ abụghị ebe kwesiri. A bụ m Rochas tupu m bụrụ gọvanọ n'Imo steeti"" ka o kwuru gbasasra ebubo na o ji ego gọọmenti rụọ ebe dị icheiche na steeti ahụ. ""Ihe ndị a niile bụ ndọrọndọrọ ọchịchị n'enweghi isi na ọdụ"" ka o kwuru. Ihe a bụ aghụghọ Uzodimma na-eme mgbe niile. Ọ mehie n'ụzọ ọbụla, o jiri ụlọikpe kpuchie onwe ya. Ọ bụrụ na e nwereike ị me mụnwa bụ Rochas ụdịrị ihe a. Kekwanụ maka ndị ọzọ?"" ka o kwuru na ngwụcha. Mmadụ asụkapụla n'ụlọikpe ebe a na-ekpe ndi otu ya ikpe Ndị mmadụ na-eche n'Owerri Magistrate court dịka ndị uweojii na-akwado ịkpọpụta Rochas Okorocha n'ihu ọha. BBC Igbo ga na-ewetere ụnụ etu ihe si aga ebe ahụ. Mmadụ iri na ise ka ụlọikpe ahụ kpọpụtara ima ikpe. Aha ha gụnyere, Chief Uche Nwosu, Lasbrey OkaforAnyanwu, Uzoma Anwuka, Ijeoma Igboanusi na ndị ọzọ. Ihe mere eji nwụchie ma kpọpụta ndị a bụ maka etu ha si wụbata n'ụlọ 'Royal Spring Palm Hotel' gọọmenti machịrị nke iwu megidere. Ndị niile ahụ kwụrụ na o nweghị ihe ọjọ ha mere. Onye ntakụkọ anyị kwụrụ ahụghị Rochas Okorocha n'ụlọikpe ahụ nke eji akpọpụta aha ha na ndị a ga-ama ikpe. Anyị atọhapụla Rochas Okorocha anwụchịrị ụnyahụ n'Imo steeti- Uweojii Imo steeti Orlando Ikeokwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti ekwuola na ha tọhapụrụ aka chiburu Imo state bụ Rochas Okorocha ndị uweojii nwụchịrị na steeti ahụ ụnyahụ. Ikeokwu gwara ndị ntaakụkọ channels nke a mgbe a na-agba ya ajụjụ n'onyonyo ha n'ụtụtụ taa bụ Februwarị 22, 2021. O kwuru na ya ndị otu ya ka na-eme nyocha ịmata ka okwu ahụ si malite na ihe merenụ. Ikeokwu kwuru na onye ọbụla ikpe mara ga-aga ụlọikpe zara ọnụ ya. Aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha akọwaala etu ndị uweojii nọ n'Imo steeti si memina ya ndị otu ya ụnyahụ. O kwuru na ọ gara ilebanya n'etu e si amachị ụlọ oriri na nkwarị ya akpọrọ Royal Palm Hotels n'Imo steeti mana ndị akpụobi ọ hụrụ ebe ahụ bidoro mewa ya na ndị otu ya iwa. O kwuru na ndị uweojii kwụ na-elele ka ndị akpụ obi ahụ nọ na-eti ndị nke ya ihe ma mechaa gbawa egbe ma were ose anya gbaa ndị otu ya so ya bia ebe ahụ. Okorocha kwuru na ndị uweojii mechara nwuchie ya mana ọ jụrụ ndị nyere ha ikike ime ihe ndị ha na-eme ya na ndị otu mgbe ha rutere na 'Royal Palm Hotel', ha kwuru na ha bụ ndị uweojii na nọ n'ụlọ obibi gọọmenti Imo steeti. Rochas kwuru na a gbara ọgọ ya nwoke egbe nke ọ na-amaghị ma ọ ka ga-adịkwa ndụ makana ọ gbara oke ọbara. O kwuru na mgbe a kpọ ya gaa n'ụlọọrụ ndị uweojii, ọ jụrụ ha ihe bụ iwu ọ dara, ndị uweojii gwara ya na ọ bụ iwu 'conspiracy' na 'Public disorder' ka ọ dara. O kwukwara na ndị uweojii gwara ya na ọbụ gọvanọ Hope Uzodimma nyere iwu ka ha nwụchie ya. Rochas Okorocha ka na-ewukwa ruo ụtụtụ a dịka ụmụ Naịjirịa ebidola kwuwe maka etu e si nwụchị ya ụnyahụ bụ Februwarị 21,2021. Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela aka chịburu steeti ahụ bụ Rochas Okorocha. Nke a na-abịa dịka akụkọ kwuru na Rochas Okorocha ji aka ya gaa ịgbape ogige 'royal palm estate' bụ nke ọchịchị Hope Uzodinma gbachiri. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu azaghị ekwentị ya oge anyị kpọrọ ya ugboro ugboro. Mana onyonyo apụtala ebe Rochas Okorocha nọdụrụ ala n'ogige ndị uweojii mana o dobeghị anya oge e sere ya bụ onyonyo. Onye enyemaka mgbasaozi Rochas Okorocha bụ Ebere Nzewuji gwakwara BBC na ọ bụ eziokwu na ndị uweojii ji nna ya ukwu. Nzewuji kwukwara na ndị ekperima si n'aka gọọmentị Imo steeti wakporo Okorocha oge ọ gara n'ụlọ oriri na nkwari nke nwunye ya nwe. Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ekperima ahụ gbara onye uweojii na-echekwa Okorocha egbe, ma merụkwaa ụfọdụ ndị ọzọ so ya ahụ. N'aka nke ọzọ, onye enyemaka mgbasa ozi Gọvanọ Hope Uzodinma bụ Oguike Nwachukwu kwuru na ihe niile Nzewuji kwuru abụghị eziokwu. Nwachukwu kwuwu na gọọmentị kpọchiri ogige ahụ akpọchi n'ihi na ọ bụ ihe a natara n'aka onye zuru ya ezu. Mana Rochas Okorocha kpọọrọ ndị agboro ga kụpụ igodo e ji kpọchie ebe ahụ ma banye ya n'ike. Nwachukwu gara n'ihu kwuo na ọ bụ ọrụ ndị uweojii ịhụ na ndị mmadụ rubere isi n'iwu gọọmentị. O kwukwara na ebubo Okorocha na-ebo na ọ bụ gọọmentị Imo steeti zigara ndị omekome wakporo ya na ndị otu ya bụ okwu asị. Cheta na gọọmentị Imo steeti kwuru na ogige 'royal palm estate' bụ ụlọ Rochas Okorocha ji ego nakwa ala Imo steeti rụọ n'ụzọ ezighi ezi. Lee onyonyo ebe kọmịshọna okwu ala dị n'aka n'Imo steeti, bụ Enyinnaya Onuegbu gbachiri ogige 'royal palm estate' nke nwunye Rochas Okorocha nwe. Nke a mere ka ha weghara ya dịka kọmiti nyochara ya bụ ihe si nye ikike. Rochas Okorocha na-arụ ọrụ ugbua dịka onye nnọchi anya mpaghara Imo West n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa bụ 'senate'. Ọ bụkwa onyeisi ụlọọrụ a kpọrọ 'Rochas Foundation' nke o malitere tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị. Gọọmentị Imo steeti, malite n'ọchịchị Emeka Ihedioha, ebola Rochas Okorocha ebubo dị icheiche gbasara nrụrụaka nakwa iri ego gọọmentị. Cheta oge kọmiti e hibere maka ịnapụta ihe gọọmentị ezuru n'ohi wakporo otu ụlọ ebe ha kwuru naUloma Nwosu, nwa Rochas Okorocha, na-ezo ihe gọọmentị dị icheiche o zuru n'ohi. EFCC depụtakwara ọtụtụ ụlọ na akụnụba dị icheiche nke ha boro ebubo na ọ bụ Rochas nwe ya. Ha kwuru na ihe ndị ahụ bụ ego si n'akpa gọọmentị Imo steeti ka Okorocha ji nweta ha. Mana Rochas Okorocha gwara BBC n'oge ahụ na ihe ndị ahụ niile bụ ebubo ụgha. O kwukwaua na ụjọ nnyocha anaghị atụ yadịghị atụ m - Okorocha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56147704 +business Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: Naịjirịa ga-abụ ọka ibe na mmanụ gasị - NLNG Akụkọ ndị dị mkpa Ụlọọrụ na-esi mmanụ gasị bụ NLNG n'ịchafụ ekwuola na ọ bụrụ na mkpebi ntinye ego ọhụrụ ha nweisi n'ọnwa Disemba, na ọ ga-eme Naịjirịa mba nke atọ Kachasị n'ibupụ mmanụ gasị n'ụwa niile. Ebe Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ na Naịjirịa bụ Ibe kachukwu ekwuola ma ntuliaka afọ 2019 agaghị egbochi atụmatụ ọma ụlọọrụ ahụ nwere. Otu jikọtara ụmụIgbo nọ na mba ofesi bụ World Igbo Congress agbarụọla ihu ma katọọ gọọmentị na-achị naịjirịa ugbua kwuo na ha ji ndị ọrụ nchekwa ebuso ndị na-ama ha aka n'ihu agha. Ozi a si n'akwụkwọ onyeisi oche ha bụ ọkanmụta Anthony Ejiofor n'ọgbakọ ha mere n'ọgbakọ ha mere na mba Amerịka. Ọrịa ebola ka na-aga n'ihu n'iwakpo ndị mba D.R Congo dịka nke malitere ọhụrụ a gburula mmadụ karịrị iri atọ. Otu ahụike n'ụwa bụ World Health Organisation kwuru na nke a nwereike iraahụ n'ịchikọta. N'egwuregwu, Akwa daara n'Enugwu n'isi ụtụtụ ụnyaahụ mgbe otu onye nkuzi otu egwuregwu bọọlụ Lamray United bụ Sunny Supremo Chukwu si n'ụra fee n'ọnwụ. Akụkọ kwuru na o mere mkpesa gbasara obi mgbu tupu ọ na-ehi ụra n'abalị ahụ. Ihe nkiri nke taa; https://www.bbc.com/igbo/afirika-45074412 +business Petroleum Industry Bill: Ọ gịnị bụ PIB a onyeisiala Muhammadu Buhari debanyere n'iwu? "Femi Adesina bụ ọnye ndụmọdụ pụrụiche onyeisiala Naijirịa edepụtala akwụkwọ ozi were sị na onyeisiala Muhammadu Buharị edebanyela iwu Petroleum Industrial Bill n'iwu Naijirịa. O kọwara na ọ bụ dịka Buhari dopuru onwe ya iche dịka iwu covid-19 siri kwuo maka ndị mere njem ka ọ debanyere ya bụ iwu n'akwụkwọ iwu Naijirịa. Adesina kwuru sị, ""Mmemme maka ya bụ iwu ọhụrụ ga-ebido n'ụbọchị wenezde dịka oge ndopu iche ya gwụchara"". Ọ kọwara na ndị omeiwu ukwu wepụtara ya bụ iwu ka atulee n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Julaị 2021, ebe ndị ụlọ omeiwu nta wepụtara ya bụ iwu n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Julaị 2021, nke a mere ka ihe echewere kamgbe mbido afọ ndị 2000 bịa na mmezu. N'ụbọchị Tọzde, abalị mbụ nke ọnwa Julaị afọ 2020, ụlọomeiwu Naịjirịa - nke ukwu na nke nta - binyere aka n'iwu a kpọrọ 'Petroleum Industry Bill' maọbụ PIB n'ịchafụ. Ọ bụrụ na Onyeisiala Muhammadu Buhari kwadoo iwu a, ọ ga-abụzi iwu ga na-achịkọta mmepụta nakwa ire mmanụ agbịdị na Naịjirịa. Ọtụtụ na-ekwu na nke a bụ otu ọkpụrụkpụ ihe nke ndị omeiwu mepụtarala. Mana ndị ọzọ na-ajụ sị, ""gịnị bụ PIB?"" Mmanụ agbịdị - maọbụ 'crude oil na bekee - bụ otu ngwaahịa kacha enye Naịjirịa ego. Ya mere o ji dị mkpa na a ga-enwe iwu doro anya na-ahụ maka mmepụta ya bụ mmanụ. Ka ọ dị ugbua, iwu na-achịkọta mmepụta na orire mmanụ na Naịjirịa bụ nke a kpọrọ 'Petroleum Act' nke afọ 1969 nakwa 'Petroleum Profit Tax (PPT) Act 1959'. E nwekwara ụmụ kịrịkịrị iwu ndị ọzọ na-ahụ maka ngalaba dị icheiche dị na mmepụta mmanụ. Mana n'ihi mgbanwe nke na-apụta ihe kwa ụbọchị, ọ dị mkpa ka e nwee iwu ọhụrụ zuru oke nke ga-ahụ maka ọdachi niile si na mmepụta mmanụ. Ọdachi ndị a gụnyere: Ọ bụ Olusegun Obasanjo tụpụtara alo iwepụta iwu PIB n'afọ 2000, mana ọ bụ Musa Yar'Adua wegara iwu a n'ụlọomeiwu Naịjirịa n'afọ 2008 Kamgbe ahụ ruo taa, Naịjirịa enweela ndị isi ala anọ, mana iwu PIB enwebeghị isi. Oge Buhari batara n'ọchịchị, o kere PIB ụzọ anọ. Ha bụ: Na 2017, ụlọomeiwu nta binyere aka n'iwu PIGB. Ndị Sineti binyekwara ya aka n'ọnwa Jenụwarị 2018. Mana Onyeisiala Buhari akwadoghị ya bụ iwu tupu agba nke mbụ ọchịchị ya abịa n'isi njedebe na 2019. N'ọnwa Sepụtemba 2020, Buhari wegara iwu PIB ọhụrụ n'ụlọomeiwu ka ha lebaa ya anya. Ọ bụ iwu nke a ka ndị omeiwu kwadoro n'ụbọchị Tọzde." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57693004 +sports Liverpool akwọọla Arsenal ka awarawa tomanto Liverpool egosila Arsenal mbe abụọ nke bụ oke oge ha ji ọkpụ goolu atọ a satara otu merie ha n'abalị Mọnde. Cheta na Arsenal bu ụzọ merie Liverpool oge ha abụọ zutere n'asọmpi Community Shield na mmalite afọ ọhụrụ 2020/2021 Mana Liverpool kọwaara ha na anụ gbalaa taa echi bụ nta. Arsenal bu ụzọ nyete goolu oge Lacazette nyere gollu na nkeji nke mbụ. Mana oteghi aka tupu Sadio Mane asaa goolu ahụ, Richrdson etinye ya mmezi. Na agba nke abụọ ka Liverpool nyetere goolu nke atọ iji gbagoro n'elu Tebulu EPL. https://www.bbc.com/igbo/afirika-54327127 +sports Watford vs Liverpool: Watford azọpịasiala Liverpool ka awarawa tomanto Ndị otu Watford emenyela ndị Liverpool egwu taa n'be ha na Vicarage Road. Na agbanyeghị na Liverpool ka bụ ndị mbụ n'asọmpị Premier League, kama mmerị a Watford ji ọkpu goolu atọ asataghị ma ncha merie ha tụrụ mmadụ nile n'anya. Onye ndụ ha bụ Virgil Van Dijk kwuru na ndị Watford gbara ọfụma nke bụ na mmerị ha kwesịri ekwesị. Van Dijk sị kwa na ọcheghị na ha mepụtara ohere inye goolu ma sị kwa na goolu atọ a tụrụ ha n'anya. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51691499 +entertainment Ego ole ka Harry na Megan na-agbakụta azụ ugbua ha chọrọ ịchọwa akara aka ha? Obi adịghị ezinaụlọ Ezenwaanyị mba Briten bụ Elizabeth mma na nwanwa ya bụ Harry na nwunye ya bụ Meghan kwupụtara na ha ga anọrọ onwe ha, chụwa ego nke ha. Ụbọchị Wenezde, Harry na Meghan kwuru na ha achọghịzịkwa ịbụ ndị welitere isi n'ezinaụlọ eze, na ha chọrọ ịgawa Kanada nakwa Amerịka ịchụ akara aka ha. Nke a na-abịa ọnwa ole na ole ha tụchara arịrị maka agwa ọjọọ ndị ụlọọrụ akụkọ na-akpaso nwunye bụ Megan. Okwa ha mara maka ịchụwa ego nke ha butere okwu ebe ka ego ha na-eribu si? Ego ole ka ha na-enwetabu? Di na nwunye a gbara ama na pasent 95 ego nnweta ha si n'aka Ọkparaeze Charles, nna Harry. Ọ na-akwụ ha ụgwọ ọrụ ọha ha na-arụ dịka 'Duke' na 'Duchess' nke Sussex nakwa ego igbo mkpa ezinaụlọ ha. Harry na Meghan eritela ike karịrị nde paụnds ise(#5m) nke pụtara ijeri naira abụọ na ụma(N2,355,000,000) bido n'afọ 2018 a lụtara Meghan were rue 2019. Ego bụ ego si n'ụlọ na ihe na-amịta ego nke Charles si na ya nweta ihe ruru £21.6m. Ha na-enwetakwa pasent ise ego site na 'Sovereign Grant' bụ ego obi eze na-eketa. Harry na Meghan eketakwara ego ruru £13m bụ ego nne Harry bụ Diana hapụrụ. Harry ketakwara ego na ekpe nnenne bụ nne mụrụ Ezenwaanyị Elizabeth hapụrụ. N'onwe ya, Meghan na-erite ego ruru £38,300 site n'ihe nkiri o sonyere na ya, ejiji nakwa ide ihe na intanet. Iwu ji ezinaụlọ Ezenwaanyị Briten enyeghị onye ọbụla bụ onye ezinaụlọ ahụ ohere ịrụ ọrụ ọzọ iji kpata ego. Ugbua ha chọrọ ịchụwa nke ha, a na-eche na ha ga-ebido nwetawa ego site na ide akwụkwọ. Ha gbaburu ama na ha chọrọ ibido ụlọrụ na-enyere ndị mmadụ aka. Ha nwekwara ihe ndị ha tinyere aha 'Royal Sussex' ha na-ere dịka mkpọ eji etinye mkpịsị odee, ihe egwuregwu nakwa ọzụzụ banyere agụmakwụkwọ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-51053613 +sports Everton vs Chelsea: Everton ewerela ajị imi Chelsea kpọrọ ụtaba Ndị otu egwu bọọlụ Everton mere ndị nke Chelsea ihe a na-eme nwata ntị ike. Everton mere ihe a na atụghi anya ya dịka ha ji ọkpụ goolu atọ asatara nani otu merịa ndị otu egwu bọọlụ Chelsea. Mmeri a na atọ ha ụtọ n'ihi na ha enweghị onye nkụzi dịka ha chụrụ Marco Silva n'ụbọchị 7 Desemba 2019. Ọ bụ Duncan Ferguson nọchitere dịka onye nkuzi Everton . Everton kpughere ite goolu ha na nkeji nke ise mgbe Richarlson De Andre ji isi were nye goolu were sị ndị Chelsea nnọọ. Chelsea gbaliri ike ha ịsa goolu a mana ndị nchekwa goolu Everton jị odeshi. Na gba nke abụọ ka Dominic Calvert-Lewin mezuru ya abụo dịka eji nkeji anọ banye na gba nke abụọ Chelsea gosikwara na ọ bụ nwoke na ibe ya na-emekọ ihe mgbe Mateo Kovacic zahachiri ha were nye ndị Chelsea olileanya. Kama olieanya ha dara mba mgbe Calvert-Lewin mezuru ya atọ were tịpịa olileanya niile ndị Chelsea nwere. Dịka ichu ndị nkụzi otu egwu boolụ na-ewu na 'Premiership', oge oruola mgbe Lam[ard jị akwara ngwongwo ya? https://www.bbc.com/igbo/afirika-50690187 +health 5G and Coronavirus: 5G ọ na-ebute coronavirus? Ọtụtụ na-ekwu na 5G na-ebute ọrịa coronavirus. Mana taata ka anyị nyobaa mara ma 5G ọ na-ebute coronavirus. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Chimezie Ucheagbo https://www.bbc.com/igbo/afirika-52165482 +business Enugu Fuel Crisis: Ihe anyị ji kpọchie ụlọahịa mmanụ ụgbọala n'Enugwu - IPMAN "Otu jikọrọ ndị na-ere mmanụ ụgbọala akọwaala ihe ha ji gbaa abụbụ ọrụ n'Enugwu n'ụbọchị Tuzde nke tinyere ọtụtụ ndị mmadụ na gbagharịa. Onyeisi otu a bụ Chinedu Anyaso kwuru na abụbụ ọrụ ahụ bụ iji mee ka Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi mepeere ha ụlọọrụ a kpọchiri akpọchi. Anyaso kwuru na kamgbe ha batara n'ọchịchị n'ọnwa Nọvemba 2019, isi ụlọọrụ ha kpọchiri akpọchi. O kwukwara na ha edeela akwụkwọ degara ndị uweojii, DSS, nakwa ụlọọrụ gọvanọ, mana onweghị onye ṅara ha ntị Anyaso gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị isi otu IPMAN n'Abuja nyere ha ikike ka ha kpọchịe ụlọahịa 'petrol' niile dị n'Enugwu. Ha machikwara ụgbọala tanka niile bu 'petrol' ịbata n'Enugwu. Nke a mere ka Gọvanọ kpọọ ha oku udo, ma mechaa nye iwu ka a kpọghee ụlọọrụ ha. Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buharị akatọọla ogbugbu Lawan Andimi bụ onyeisi ndị ofufe Kraịst n'obodo Michika dị n'Adamawa Steeti, bụ onye ndị otu oyiegwu gburu, na-agbanyeghị na ha gosipụtara na ha chọbụru ịhapụ ya. Buahrị kwuru na ọ ga-agbalị na ndị oyi egwu a ga-erite ụgwọ ihe ha mere n'uju ya. O tiri ndị ofufe kraịst niile na Naijirịa, ndị otu CAN na ndị ezinaụlọ ya aka n'obi ma sị ka ụwa niile tinye aka ka a kwụsị ndị otu oyiegwu a niile. Ma sịkwa na ""Nke a agbaala ha ume dịka ndị gọọmentị na ndị agha Naijirịa imeri ndị otu oyi egwu niile na Naijirịa ma na ọdida anyanwụ Afrịka. Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela ngalaba na-ahụ maka azụmahịa na nrụpụta ihe ntuziaka ka a rụọ ụlọọrụ ji ihe akọpụtara n'ubi arụpụta ngwaahịa na steeti niile dị na Naịjirịa. Mịnịsta nta na-ahụ maka azụmahịa na nrụpụta ihe bụ Mariam Katagum kwuru nke a ụbọchị Wenezde. Katagum kwuru na atụmatụ ahụ ga-eme ka akụnụba Naịjirịa bawanye, ma mekwaa ka nri dị n'uju n'obodo Mba Briten na Naijirịa enweela nkwekọrịta itinye ego n'azụmahịa nke ruru otu ijeri naịra na iri ise na atọ na ọma. Ọ bụ na nzụkọ UK-Africa summit na-eme na Lọndọn ugbua ka ndị oji ego achụ ego nke mba UK na Naijirịa nwere nkwekọrịta a. Ọrịa si na nje coronavirus nke sitere na China selite isi na-esinwanye ike dịka ndị na-ahu maka ahụike na mba ahụ kwuru na nje ahụ nwere ikike ịmụba onwe ya, nke ga-eme ka ọ gbasaa n'ike. Ka ọ dị ugbua, ọrịa a egbuola mmadụ itoolu ma gbasaa ruo mba Amerịka,Taịland na Saụt Korịa. Ndị otu egwu bọolụ Arsenal sitere ọnwụ wee gbata onye lawa onye Lawa dịka ha zutere Chelsea n'asọmpi Premier League. N'agbanyeghị na ha dị naanị mmadụ iri agba ndị Chelsea zuru ezu, ha gbalịrị ịhụ na ha abụọ jị goolu abụọ abụọ were laa. Nwaada Nigeria bụ Eniola Aluko esonyerela ndị otu egwuregwu bọọlụ Aston Villa nke mba England dịka onyeisi nhazi egwuregwu maọbụ 'Sporting Director' na Bekee. Eniola bụ nwanne Sone Aluko onye gbaara ndị otu 'Super Eagles' nke Naịjirịa n'oge gara aga. Mana Eniola bụ ụmụnwaanyị mba Ịngland ka ọ nọchitere anya ha oge ọ na-agba bọọlụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51203625 +entertainment Hollywood: Ndị Igbo nọ ebe ahụ "Igbo so n'otu ndị a kacha mara n'ụwa niile n'ihi na aga njem n'ebe niile ụwa sọtụrụ. Ugbua anyi ga-etinye anya wee hụ ihe ndị Igbo wetara tinye n' ihe gbasara ihe onyonyo na egwu na Hollywood. Ha bụ ndị eji eme ọnụ na Hollywood Nonso Anozie, Ashley Madekwe na Chinwetel Ejiofor bụ mmadụ atọ na-eme ihe onyonyo na Hollywood. Ha emela ihe onyonyo ama a ma dịka ""12 Years a Slave"", ""Revenge"" na ""Game of Thrones"". Mmanwụ Mgbedike E gosiri ihu mmanwụ a kpọrọ 'Mgbedike' bụ njirimara Ndigbo. Ọ bụghị sọsọ Igbo na-ekpu mmanwụ mana e ji nke a mara anyị. Okpu mme Onye oti egwu Kendrick Lamar gosiri okpu mme bụ njiri mara ndị Igbo n'ihe onyonyo egwu ya bụ ""All the stars"" Aha na asụsụ ndị Igbo N'ihe onyonyo ""Black Panther"", Danai Gurira zara 'Okoye' bụ aha Igbo ebe Winston Duke mere ka M'baku sụrụ asụsụ yiri asụsụ Igbo 'Igbo Landing' Ụnụ ama na n'oge ndịọcha n'akpụrụ ndị isi ojii ndị Igbo dịka ndịohu, ọtụtụ ndị Igbo dagbunyere n'ime mmiri kama ha ga-ekwe bie ndụ ha dịka onye ohu? Ya ka bekee kpọrọ ""Igbo Landing"", eji ya ama atụ n'ụwa niile ma na a sọpụrụ ndị Igbo maka ụdị mmụọ ha nwere. Beyonce megharịrị ihe a n'ime onyonyo egwu ya bụ ""Love Drought"" nke pụtara n'afọ 2017." https://www.bbc.com/igbo/afirika-43858571 +politics Leah Sharibu: Anyị na-enwe mkparịtaụka ịzọpụta ya na ndị ọzọ a tọọrọ - Gọọmentị etiti "Gọọmentị Naịjirịa kwuru na ha amalitela mkprịtaụka n'isi ndị a tọọrọ n'ugwu Naịjirịa nakwa Leah Sharibu. Nke a na-eme dịka aha Leah wuru ewu na soshal midia ụbọchị Tọzde dịka a na-ebo ebubo na ọ nwụọla n'ihe onyonyo Boko Haram ziputere. Mana ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu kwuru n'ime ozi o zipụtere site n'akara Twitter ya, na gọọmenti n- ndị na-echere ozi ka na-kparịta etu a ga esi kpọpụta Leah and ndị ọzọ Boko Haram. N'otu aka ahụ, Nna mụrụ Leah Sharibu ekwuola na o nwebeghi ihe ọ nụrụ maka nwa ya nwaanyị na nsonso a. Mgbe BBC kpọtụrụ ya n'ekwentị, ọ kọwara na ịkpeazụ ya na onyeisiala kpakọrịtara bụ afọ gara aga. ""Ọ bụ sọsọ ndị otu okpukpere m na ndị otu alakụba na-akasi m obi gbasara Leah"" ka o kwuru. Cheta na otu ihe onyonyo ahụ pụtara na-egosi mmadụ isii ndị ọrụ enyemaka ka ha na-arịọ gọọmentị ka enyemaka ịgbapụta ha n'aka ndị Boko Haram na mpaghara Ugwu Naịjirịa. N'ime ihe onyonyo ahụ, otu nwaanyị na-ekwu na a wakporo ha, kpọro ha gawa ebe ha amaghị. Ndị ọrụ enyemaka a kpọrọ Action Against Hunger sị na mmadụ isii nọ n'ime ihe onyonyo ahụ bụ ndị ọrụ ha. Otu n'ime ndị ọru enyemaka ahụ kpọro onwe ya, Grace yi uwe ndị ofufe Alakuba, ebe ụmụnwoke ise a na-eche na ha bu ya na-aha na-arụkọ ọrụ gbara ya okiri kiri. Nwaanyị a kpọrọ oku ka gọọmentị Naịjirịa na ndị mba ofesi mee ngwa ngwa gbapụta ha. Na mbido izu a, Action Against Hunger zipurụ akwụkwọ mgbasaozi sị na a wakporo otu ụgbọala ha n'ụzọ Damasak. Ha kwuru na otu n'ime ndị na-akwọrọ ha ụgbọala nwụrụ ebe ndi otu ha ndị ọzọ na-efu efu. A na-eche na aka Boko Haram na Islamic State of West Africa Province (ISWAP) dị na mwakpo a na-eme n' Ugwu Naịjirịa. Ndị agha Naịjirịa na-ekwu na ha emekpaala otu ndị a ahụ mana ha ka na-akpa ike dị egwu na mpaghara ahụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49111268 +sports Bayern Munich vs Chelsea: Munich emegheela ọnụ ụzọ eluigwe kwapụ Chelsea Ndị Bayern Munich pịkọrọ Chelsea ka mpempe akwụkwọ tụfuo ha dịka ha ji ọkpụ goolu anọ a satara otu merie ha mgbe ha zutere n'Allianz Arena. Naanị otu goolu Tammy Abraham nyerela Chelsea na nkeji 44 ezughi ịzọpụta ha n'aka ndị Bayern bịara ịgwọ ha ara. Robert Lewandowski bu ụzọ jiri penariti dọkaa neetị Willy Caballero na nkeji 10, tupu Ivan Perisic emezuo ya abụọ na nkeji 24. Corentin Tolisso tụkwasịrị ya nke atọ na nkeji 76, tupu Lewandowski akụnyezie ntu n'igbe ozu Chelsea na nkeji 83. Mkpokọta goolu anọ a satara otu ha gbara (4 - 1) na nke atọ a na-asaghị asa (3 - 0) ha ji zọgbuo Chelsea mgbe ha bịara Stamford Bridge n'ọnwa Febrụwarị, ka ha ji kwapụ Chelsea n'asọmpi Champions League nke afọ a. Chetakwa na ọ bụ ha ka Chelsea meriri wee bulie iko Champions League mbụ ha n'afọ 2012. Ka ọ dị ugbua, Bayern Munich ga-ezute Barcelona n'agba nke anọ-ikpeazụ n'ụbọchị Fraịde bụ 14 nke ọnwa Ọgọstụ, ebe ha ga-ama onye a ga-agbara ụgbọ nwa mkpi. https://www.bbc.com/igbo/afirika-53711043 +entertainment Ada Jesus dead: Harrison Gwamnishu akọwaala etu Ada Jesus si nwụọ "Harrison Gwamnishu bụ onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onwe ya agbaala ama na e burula ozu ọkpaochị Mmesoma Obi gawa Ala Igbo maka akwamozu na olili ya. Ada Jesus nwụrụ n'ụzọ ụtụtụ ụbọchị Wenezde, n'ụlọọgwụ Zenith Medical Centre, dị n'Abuja . Dịka Gwamnishu siri gwa BBC Igbo na mkparịtaụka anyị na ya nwere n'ụtụtụ Tọzde, ndị dokịta chọpụtara ọrịa gụnyere ọrịa akịrị, kansa nke ara nakwa mkpọnwụ ahụ n'ahụ ya ka ha nyochara ya. O kwuru na ndị dọkịta nyere ya nleta mere ka ọnọdụ ya dịtụ mma tupu ọnọdụ ya akawanye njọ n'abali Tuzde mgbe a dụchara ntụtụ, ""ọ kwụsịrị ikwu okwu tupu dọkịta agwa anyị na ọ nwụọla"". Gwamnishu sị, ""ọ bụrụ na anyị matara n'oge maka ọnọdụ ahụike ya, ikekwe ọ gaghị anwụ."" ""Mana otu ihe mere bụ na ndị mmadụ gosiri ya ịhụnanya n'oge ikpeazụ ya."" ""O nwere ọgwụ a gbara ya, di ya kwuru na ọ bụ ka a gbachara ya otu ọgwụ ka ahụ bịara na-agbakasị ya, na-enye ya nsogbu."" O kwukwara sị na ọ bụghị 'ihe e zigara eziga' dịka ihe mmụọ tinyere Ada na nsogbu ahụ, na ọ bụ na ekwuputaghị maka ọrịa a n'oge. O kwukwara na ọtụtụ ndị mmadụ nọ na-akpọ ya na-ekwu na ha chọrọ iji obiọma ha nye Ada Jesus akịrị nke ha, iji hụ na ọ gbakere ma nwere onwe ya. Gere mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'uju ebe a: Lee ihe Gwamnishu kwuru na Facebook ya: Omee ihe ejije a ma ama bụ Rita Edochie ekwuola na ya bụ ""mkpụrụ agaghị egbuli egbu"". Nke a bụ nkwupụta mbụ ya ka ọ gachara otu abalị ọkpaọchi Mmesoma Mercy Obi bụ onye a ma dịka 'Ada Jesus' jiri nwụọ. N'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya, ọ sịrị na Chukwu mere ya nwaanyị siri ike nke ya ga-abụgide. ""Chukwu ji ike niile mere m nwaanyị siri ike, aga m adịrirị etu ahụ."" ""Mkpụrụ a gaghị egbuli egbu."" Tupu Ada Jesus anwụọ, ya na Rita Edochie nwere nghọtahie nke mere ka Edochie kwuo na ọ gaghị agbaghara ya, mana n'izu ole na ole gara aga tupu Ada Jesus anwụọ, Edochie kwuru na ọ gbagharala ya. Mana dịka Edochie mere nkwupụta ahụ taa bụ Tọzde, ọtụtụ na-eso ya na-akatọ ya maka enweghị obi mgbaghara, ebe ụfọdụ kpọrọ oku ka a kwụsị ikiri ihe ejije o so na ya. Rita Edochie, Odumeje na ihe ndị ọzọ a kpụ n'ọnụ maka ọnwụ Ada Jesus Naijiria dị ndị ezinaụlọ ya na ndị ihe ya amasi ka Ghana dịka akụkọ ọnwụ ya pụtara ihe taa bụ Wenezde. Mercy Mmesoma Obi a ma dịka ""Ada Jesus' nwụrụ n'ụlọọgwụ dị n'Abuja e bugara ya maka ịgwọ ya ọrịa metụtara akịrị. Dịka akụkọ siri kwuo, ọnọdụ ya kawanyere njọ n'abali Tuzde foro Wenezde, ebe ọ nwụrụ n'ụtụtụ taa ka o mechara abalị ole na ole o jiri mechaa ncheta afọ 23 a mụrụ ya. Ọtụtụ ndị mmadụ ma Ada Jesus dịka ọkpachị ma lee ihe ndị ụfọdụ ị maghị maka ya: Ọnwụ ya bụkwa ihe butere mwute nakwa arịrị n'uche ọtụtụ ndị mmadụ n'ihi na ọrịa ọ rịa ọtụtụ oge tupu ọ nwụọ. Lee ihe ha na-ekwu na soshal midia maka ọnwụ ya: Ọtụtụ ndị ihe Ada Jesus na-amasị na-akatọ onye na-eme ihe ejije a ma ama bụ Rita Edochie nakwa ụkọchukwu Chukwunaeme Ohanaeme a ma dịka 'Odumeje' maka okwu ha kwuru makaAda Jesus dịka ọ nọ n'akwa ọrịa. Edochie na Odumeje kwuburu na ha agaghị agbaghara Ada Jesus maka okwu ndị o kwugide ha nke ha kwuru bụ okwu asị. Adaeze siri na Edochie kwuru na isi Ada Jesus agaghị eji isi ya pụta n'ọrịa ya, na ugbua a na okwu ahụ emezuola. Chumalo kwuru na ọ bụrụ ezie na Ada Jesus anwụọla, na Rita Edochie kwesịị ịza ajụjụ maka ya. Bigjohn na-ekwu na Odumeje na Rita Edochie anaghị agbaghara mmadụ, kedụ ka ha sị arịọ chukwu mgbaghara. Everest na-ekwu na ọ nwụghị maka na ọ kparịrị Odumeje na Rita Edochie, na ọ bụ ọnwụ buru ya. Captain Aluko na-ekwu ka Chineke gbaghara ndị niile jụrụ ịgbaghara ya. Oge BBC gbalịrị ịnụta olu Rita Edochie maka ihe na-akpọtụ, ọ zaara ekwentị ya ma gwa anyị na ya nọ na nzukọ na ya enweghị ike ikwu ihe ọbụla ugbua. Mana ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ọbụghị ọgụ mmụọ gburu Ada Jesus, na ọbụ ọrịa akịrị nakwa enweghị ezi nleta n'oge. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" https://www.bbc.com/igbo/afirika-56817092 +politics Nnamdi Kanu's Trial: Mkpamkpa na-akpa n'Ọwụwa Anyanwụ na-ewute Nnamdi Kanu - Ifeanyi Ejiofor Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu gwara BBC Igbo maka echiche ha maka ikpe ya ga-adị n'ụlọikpe n'ụbọchị Ọktoba 21, 2021. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58984110 +health Achaere na ọrịa ndị ọzọ Igbo kwenyere na ọgwụ Bekee anaghị agwọ Onye dibia ọdịnala bụ Duruagwu Duke Ukeje kọwaara ihe mere e ji a sị na achaere bụ ọrịa ọgwụ Bekee na-agaghị agwọli. Ọ sị na etu e si ebute achaere bụ site na nke mmadụ mere mmadụ ibe ya maọbụ site n'ihe ihe mmadụ riri n'ọnụ ya. Ọ sị na ọgwụ Bekee anaghị agwọ ọrịa achaere a kama na ọgwụ ha na-enye aka iji gbochie ọnya ọrịa ahụ ịmụba. Mana onye dọkịta Bekee sị na achaere bụ ọrịa kansa na-eme onye nwere ọrịa shuga. Ọ sị na ọ na-aka njọ maọbụrụ na onye ahụ o mere achọpụtaghị ya n'oge na nke na-eme ka ọnya ya na-amụba. Kirie ihe ha kwuru n'uju https://www.bbc.com/igbo/afirika-57491261 +entertainment Big Brother Naija: Lamborghini Mercy abụrụla Ugoeze Big Brother Naija "N'ikpeazụ 'Lamborghini' Mercy atụrụla ugo dịka Ugoeze n'ihe emume onyonyo nke Big Brother Naija. Dịka ọgụ, mgba, oge ịhụnanya nakwa esemokwu mere n'ime ọnwa atọ gara aga, Mercy meriri Mike iji bulie agbaego a na-ala. A chụpụrụ Frodd, Seyi na Omashola n'emume n'abalị ụbọchị ụka bụ ụbọchị isii nke ọnwa Ọktoba 2019, tupu a kpọpụta aha Mercy. Cheta na ihe emume a ji mmadụ iri na ise malite n'ụbọchị 30 Juun, afọ 2019 rue taa otu onye pụtara dịka ọkaibe. Ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo ekwuola na ọ dị mfe onye Igbo ịbụ onyeisiala n'afọ 2023 karịa inweta Biafra. N'ime akwụkwọ ozi onyeisi ha bụ Okechukwu Isiguzoro na odeakwụkwọ ha bụ Okwu Nnabuike wepụtara, otu a kpọrọ okuka ndị Ipob nakwa ndị Igbo niile gbakọta aka iji họpụta nwafọ Igbo dịka onyeisiala. Otu gara n'ihu kwuo na ha ga-enye ndị mpaghara ndị ọzọ ngarị iji mee ka ha dọnyere ndị Igbo ukwu ịhọpụta onyeisiala. Ohanaeze Ndigbo kwuru na ha ga-arịọkwa otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka ha họpụta onye Igbo ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa onyeisiala. Gọọmentị akwụwala ụgwọ ọnwa opekatampe - Ngige Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na gọọmentị etiti amalitela ịkwụ ndị ọrụ ogodo ha kachasị nta ụgwọ ọnwa opekatampe puku naịra atọ. Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị na otu jikọtara ndị ọrụ ka na-arọzi olu maka nke ndị ọrụ nọ n'ogogo dị elu. N'ofesi Otu nwoke ji egbe agbagbuola mmadụ anọ ma merụọ mmadụ ise ahụ n'otu ụlọ a na-aṅụ mmanya n'obodo Kansas dị n'Amerịka. Ndị uweojii gwara ndị ntaakụkọ BBC na nwoke na-asụ asụsụ ndị Spen riri mbọ mbọ ọsọ ngwa ngwa ọ gbachara arụ a. N'egwuregwu Wolverhampton Wanderers ji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu lụọ ndị Manchester City dịka nwụnye n'asọmpi Premier League. Chelsea ji ọkpụ anọ asatara otu tie Southampton mmọnwụ ebe Arsenal ji otu ọkpụ merie Bournemouth. Nkeji Ihe nkiri Gọvanọ Borno akpọla ndị nsọ ga-eji ekpere chụpụ Boko Haram Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum ahọpụtala ndị ekpere 30 bụ ndị ọ sị na ha ga-aga ala nsọ bụ ebe ha ga-eje kpọpee ekpere dị ekwụ bụ nke ga-ememila Boko Haram na steeti ahụ na ndị nọ ya nso bụ ebe ọrịa Boko Haram ji aka. Nke a si na ọnụ onye na-ekwuchitere ya bụ Gọvanọ bụ Isa Gusau bụ onye kwuru na ndị ekpere iri atọ a adịla njikere ị ga ala nsọ ha na Saụdị Arebia bụ ebe ha ga-anọ kpọpee ekpere ga-ememila ndị omekaome a. Gusau kwuru ụbọchị Satọde na "" Gọvanọ Babagana Umara Zulum na ndị ekpere iri atọ bị na Makkah enweela nkwekọrịta maka ị kpe ""Dawaf' kwa ụbọchị maka ịmemila Boko Haram na steeti ndị ọmetutara"". O kwughị ma ego eso na ya bụ nkwekọrịta mana ọ sị na ndị ekpere a sị Borno, Katsina, Zamfara nakwa Kano steeti. O kwukwara na ndị nsọ a bụ ndị tagoro ọjị ụwa n'ekpere bụ ndị nọgoro ihe ruru afọ iri anọ na Ka'aba bụ ụlọnsọ ha na-efe Chukwu. Ka'aba bụ ebe kacha nsọ na Al-Haram Mọsk dị na Makkah. Gusau sị na ekpere ndị a ga-enyere ndị agha aka imeri Boko Haram kpamkpam ma wetakwa udo tọrọatọ na Steeti ha. Isreal Adesanya eturula ụgọ UFC243 middleweight Isreal Adesanya nwaafọ Naịjirịa nke a na-etu ""Last Stylebender"" akụpụla Robert Whittaker mkpụrụ ọkwụrụ n'anya maburu mbenaukwu nturugo nke UFC middleweight championship nke na-akpọtụ na ọgbọọgụ Melbourne, Australia. Adesanya ji iwe kụpụ Whittaker anwuru n'anya nke Bekee kpọrọ ""knockout"" n'agba nke abụọ. Ọ kpara ike a site na ịkụ ya ọkpụ 3:33 bụ ebe ọ nọ menye ya bụ nwoke ihere n'ihu mmadụ puku iri ise na asaa. Mmeri a mere ka ọ rigoro na ogoogo 18-0 bụ nke mere o jiri bụru ọkaibe na ya bụ ""middleweight"" Adesanya gwara Jon Aik bụ onye nkọwa nke ọkpa ahụ "" ọbara gbaburu m n'ime, ụgbụa nke ya agbawala ya"". Nwafọ Naịjirịa bụ onye na-anọchite mba New Zealand bụzị onye ji mbenukwu nke ""middleweight title"" na egwuregwu UFC 243. Ọsọ tara na mmeme BBC 1 Extra na Birmingham Arena Obi ọjọọ ji ndị mmadụ ụnyahu bụ Satọde ka ndị amakekwu tisara mmeme ndị BBC 1 Extra kpokobara na Birmingham Arena. Ya bụ ahịa họrọ onyeukwu na onyenta ebe ihe ruru mmadụ 15,800 kwuru ụkwọ ya bụ mmeme gbara aka lawa na-ekirighị ihe ha jiri bịa. BBC 1 Extra buputara egwu ndị ọhụrụ nakwa nke dị ochiedike dị n'egwu bụ nke azụchara oche niile dị n'Arena. Mmadụ dịka Aitch, French Montana, Ms Banks, Wizkid na ndị ọzọ bụ ndị buputara egwu ha ọgbọ. Mana ọrụ kụrụ akụ. Otu onye n'ime ndị BBC kpọrọ bịa ya bụ egwu bụ onye ọmambem Bekee akpọrọ Krept bụ onye asị na-akụrụ ihe na ya bụ emume eji kagbuo ya. Ya bụ nwaadị gbara afọ 23 azaala n'akara Twitter ya na ya enweghị nsogbụ ọbụla. Dịka ndị uweojii na-ama ime n'ala ka ha chọpụta nke bụ eziokwu na ndị mere ya bụ ihe, ha sị na ya bụ nwaamadị emerughị ahụ ọbụla. Ndị Isiaku Alayi dị na Okpuruọchịchị Bende nke Abịa steeti chizi obi na aka dịka alaọmajijii mebichara ugbo na ụzọ ha. Eze Uche Akukwu nke mbu na Alayi akpọkuola Gọọmenti ukwu ma nke nta ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka maka ụganị nke nwere ike ịdakwasị ha maka ọdachi a. Ndị Naịjirịa kee nkwụcha chebiri abụbụ ọrụ kacha abụbụọrụ site n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Ọktoba. Onyeisi ndị Trade Union Congress bụ Quadri Olaleye kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti etiti elebeghị anya na ibuli ụgwọ ọnwa ndị isiọrụ bụ nke ha bidoro ịgba ụgwọ ya kemgbe na egwu ga adị. O gbugbu mmadụ na mmeru ahụ a ezuolanụ! Otu na ndị isi United Nations bụ Jeanine Hennis-Plasschaert tiri mkpu maka otu narị mmadụ egbugoro na mba Iran site na ngagharịiwe amalitere kemgbe izuuka. Ndị Iran na-eme ngagharịwe maka agụ, enweghị ọrụ na mpụ ha sị na ọ ka nkụ na obodo ha. N'egwuregwu, taa bụ oke ụbọchị na Premịa Lig dịka Arsenal ga-ezute Bournemouth, Man City na Wolves ga-ezute onwe ha. Southampton na Chelsea ga-akwata ebe New Castle na Manchester United ga-ama ọkaibe." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49950469 +sports Wolves vs Man United: Di na nwunye a ekpeela udo n’alụmdinanwunye ha "Mbọ niile otu Manchester United gbara ịhụ na ha gbara Wolverhampton alụkwaghịm biri na 'onye lawa onye lawa'. Man Utd bu ụzọ jaa eze dịka Anthony Martial dọriri neetị na nkeji 27. Mana Ruben Neves nke Wolves sị ha ""taa kpuchie ọnụ"" ka ọ sara goolu ha na nkeji 55. Goolu ahụ bu ọbara mgbalielu nke ya bịa dịka ogbuopi kwụsịrị bọọlụ ka e were ihe onyonyo Video assistant referee (VAR) nyochaa ma ọ gara ọfụma. Man Utd nwetara ohere ifere di ha aka na nkeji 67 oge ha nwetara penariti ka Conor Coady gbaturu ya. Mana Paul Pogba riwara ha obi ka Rui Patricio kwapụrụ bọọlụ. Raul Jimenez so ""kwụọ ụgwọisi"" Man Utd n'afọ gara aga, nwakwara ike ya ọkachasị n'ọkara nke abụọ, mana isi ya apụtaghị. Mbọ niile Man Utd gbara iji gbapụta onwe ha ma zaa aha nna ha enweghi isi, n'agbanyeghi na ha gbara ọfụma n'ụzọ gaara enwetara ha mmeri. N'otu aka ahụ, nwebata Wolves webatara Adama Traore n'ọkara nke abụọ nyerela ha aka ime ka egwu dagharịa, nke butere goolu ha mechara nye. Man Utd ga-ezute Crystal Palace ụbọchị satọde bụ 24 nke ọnwa Ọgọstụ, ebe Wolves ga-ezute Burnley ụbọchị Sọnde bụ 25. Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49392541 +business Ọgbambọ: Etu m si hapụ ọrụ ọkaiwu kwawa akwa Ihe ọdachị mmadụ nwere, nwereike ibụ ngozi nye ya. Nke a bụ akụkọ Prince Uche hapụrụ ọrụ ọkaiwu ya rụwa dụa dụa n'Aba. Ị ga-amụta ọtụtụ ihe n'ime akụkọ a. https://www.bbc.com/igbo/media-50903506 +health Dibia bekee: Kwụsịnụ iṅụ akpụrụachịa Ọtụtụ ndị mmadụ na-eche na ọ bụ mgbe ị ṅụrụ mmanya ọkụ karịa otu karama ka ị ga-adaba na nsogbu. Mana ndị dibia bekee ekwuola na o nwere mmanya ọkụ na-ekwesịghị ịba mmadụ ọnụ. Ufọdụ ndị BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwuru na aha a na-enye mmanya ọkụ a na-ere n'akụkụ ụzọ akpọrọ akụrụ akụ n'atọ ọchị. Ha gụnyere akpụrụachịa, energy 2000, kerewa, fonofiri, kparaga, ogidiga, Ibile, baby ọkụ, Kogbebe, monkey shoulder, koboko, dadubule, apoko, gallant, pasa bitters, osomo, orimalu, nakwa durosoke. Ọ pụtara na mmanya ọkụ adighị mma? Otu dibia bekee akpọrọ Darlington Akahara, gwara BBC Igbo na mmanya ọkụ nwere oke ga abụ ị ṅụọ ya o dozie ahụ, oke ahụ bụ pasentị abụọ na ọkara. Ọ dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ gbaara ụmụ mmanya ọkụ akpọrọ akpụrụachịa ọsọ, maka na ngwongwo dị na ya na-egbu umeji anụ. Ọ kọwara ihe kpatara akpụrụachia ji dị njọ. Gere ihe o kwuru n'uju ebe a. Otu ihe si kwuru ụgbụa, ọ dị oke mkpa ka ndị isi oche leba anya na mgbalite mmanya ike nke gazugoro ala Naijirịa. Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka nri na ọgwụ akpọrọ NAFDAC ekwuola na pasentị iri asatọ mmanya ọkụ eji ahihia mepụta adịghị nma n'ahụ maka na ọ na-eripiasị ụfọdụ akụkụ ahụ mmadụ. https://www.bbc.com/igbo/43085664 +sports Eji m ụkwụ ụkpọrọ malite ịgba bọọlụ n'Aba - Uchenna Kanu Uche Grace Kanu bụ nwa afọ Naijirịa na-agbara Super Falcons bọọlụ akọwaala etu o si malite ịgba bọọlu ma ruo n'ogogo ọ nọ ugbua. Na mkparịtaụka pụrụ iche ya na BBC Igbo nwere, Kanu sị na njem ịgba bọọlu ya malitere n'Aba mgbe ọ dị obere, oge ha na-agba ụkwụ ụkpọrọ agba bọọlụ dịka ihe egwuregwu.Eji m ụkwụ ụkpọrọ malite ịgba bọọlụ n'Aba - Uchenna Kanu Kalu sị na ọ gbara bọọlụ n'ọtụtụ ebe n'Aba gụnyere Etche road, Okigwe road, Boys Technical College (BTC) dị na Faulks road. Mana mgbe ọ malitere iji bọọlụ kpọrọ ihe bụ oge na ọ gbara otu egwuregwu 'Pepsi', Abia Angels mgbe a ka na-akpọ ha 'Standard Babes'. Kanu sị na ọ bụ amara Chineke mere ka o ruo n'ogogo ọ nọ ugbua bụ ịgbara Super Falcons nke Naịjirịa nakwa Tigres Femenil nke Mexico bọọlụ. Ọ gara n'ihu nye ndị na-agba bọọlụ chọrọ ịdị ka ya ndụmọdụ ka ha rubeisi, nwee umeala nakwa na-ege ndị nkuzi ha ntị. Ọ sị na nke ka nke bụ ịtụkwasị Chineke obi, na ọ bụ ihe ndị a ga-enyere ha aka iru ogogo ha chọrọ. https://www.bbc.com/igbo/articles/c0d114mkezzo +health Covid 19 Vaccine Nigeria: Ihe mere m mgbe a gbachara m ọgwụ mgbochị covid-19 "Dọkịta Ije Akunyili na-arụ n'ụlọọgwụ ebe a na-elekọta ndị na-arịa covid-19 kwuru na kamgbe ọgwụ mgbochi gbasara covid-19 pụtara , ụjọ anaghị atụ ha ma ha na-eleta ndị na-arịa ọrịa covid 19. O kwuru na mgbe ọ gbara ọgwụ mgbochi a n'izuụka gara aga, obere ahụ ọkụ metụrụ ya mana o nweghị ihe ọzọ ya bụ ọgwụ mere ya. O kwuru na o teela e bidoro mewe nyocha maka ọgwụ mgbochi a kpatara o ji dị mfe iwepụta ya ugbua. O kwuru ka ndị mmadụ leghara anya izu ọjọ a na-agba maka ọgwụ mgbochi covid-19 nke Pfizer, Moderna nakwa AstraZeneca ma nabata ya iji gbanahụ maka mkpa mkpa covid na-akpa. Dọkịta Akunyili kwuru na ụjọ ya bụ na agaghị enwe ọgwụ mgbochi ole ga-ezu ụmụ Naịjirịa. Cheta na ọ bụ naanị puku narị ọgwụ mgbochị a ka gọọmenti kwuru na ha na-ebute na Naịjirịa n'izu a. Naịjirịa o nwereike ịwepụta ọgwụ mgbochi nke ha? Dọkịta Ije Akunyili kwuru na dịka India, Chaịna nakwa Rọshịa si nwe ọgwụ mgbochi nke ha, Naịjirịa kwesiri inwe ọgwụ mgbochị nke ya. O kwuru na ọ bụrụ na covid-19 a jiri ike bata na Naịjirịa , anyị enweghị ngwa ọrụ ahụike zuruoke imemina ya. Ọ kwuru na ndị okenye niile gbaa ọgwụ a , ọ ga-amagbu onwe ya ma mee kwa ka anyị mepee ebe niile bụ ebe ọha na Naịjirịa na-atụghị ụjọ. N'okwu ya, ""Gọọmenti kwesiri inyocha etu a ga-esi kesaa ya bụ ọgwụ mgbochị, o kwesighị ịbụ naanị ndị ọchịchị kwesiri inwe ohere ị gbaa ya bụ ọgwụ. O kwuru na gọọmenti kwesiri ịnwe onye dịka dọkịta Fauci nke Amerịka ndị Naịjirịa ga-atụkwasị obi ga na-agwa ndị mmadụ maka etu ihe niile gbasara ọgwụ mgbochi a si aga. O kwuru na ọ bụ naanị ya nwetegoro ọgwụ mgbochi a n'ime ezinụlọ ya bi n'Ameịrịka, ebe ndị ezinaụlọ ya ka na-eche inweta nke ha. Dọkịta Akunyili kwuru na Naịjirịa kwesiri inweta nke AstraZeneca dịka mba na-adịgị enwekarị ọkụ makana ọgwụ mgbochi ahụ anaghị e ji ike emebi dịka nke Pfizer maọbụ Mordena. Dọkịta Ije Akunyili kwuru na o nwere olileanya na anyị ga-apụtali n'oge covid 19 ma ọ bụrụ na anyị na-eme usoro World Health Organisation wepụtara maka igbochị ọrịa a ma narakwa ọgwụ mgbochị a." https://www.bbc.com/igbo/afirika-55695818 +politics Akụkọ kachasị n'abalị a: Atiku chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n'okpuru PDP n'afọ 2019 Isiokwu ndị dị mkpa n'abalị a: Atiku chọrọ ịbụ onyeisiala Onye bụbụ osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar, ekwuputala ebumnobi ya isonye na ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019. O kwuputara na ọ chọrọ ịzọ ọkwa a n'okpuru PDP n'ọgbakọ ndị otu PDP mere n'Adamawa bụ obodo ya taa. Atiku gwara ọha na-eti aha ya na ọ ga-agba mbọ ịkwụsị ihe ịda oke ọnụ nke Bekee kpọrọ inflation, ma kwụsịkwa enweghị ọrụ dị na Naịjirịa. O kwukwara na Onyeisiala Buhari na ndị otu pati APC anaghị egosi ike ha n'ihe ndị kacha metụta ndị bi n'obodo. Alex Otti ekwuputala ebumnuche ya ịzọ ọkwa gọvanọ nke Abia steeti na ntuliaka afọ 2019. Otti kwuru na oge eruola ịzọpụta ndị Abịa n'ihe ọjọọ niile o kwuru na ha na-agabiga. O kwukwara na ndị otu PDP zunahụrụ ya mmeri o meriri na nke 2015. Na mba ofesi, Nwa ntakịrị dị naanị afọ anọ agbagbuola nwa dị afọ abụo ka o ji egbe mpa nnukwu ya na-egwu egwu n'obodo Muscoy dị na mba Amerịka. A nwụchiela mpa nnukwu ahụ, ebe a ga-ekpe ya ikpe maka ịhapụ egbe ya ebe aka nwantakịrị nwere ike iru. Bayern Munich gbara PSG ọkpụ atọ asatara otu taa ka ha zutere n'asọmpi International Champions Cup. Ọtụtụ ndị egwu PSG so gbaa asọmpi Iko Mbaụwa dịka Mbappe na Neymar esonyeghị n'egwuregwu nke taa. Ebe Borussia Dortmund ji otu ọkpụ merie Manchester City na ya bụ asọmpi. Lee ụmụafọ Naijiria tọrọ na Rọshịa ka ha na-abanye ụgbọelu ịlọta Naijirịa https://www.bbc.com/igbo/44911968 +politics Ụlọomeiwu n'Imo steeti akpọghachịtela onye bụbu onyeisi ụlọomeiwu ha achụturu n'ọkwa ruo ọnwa ise "Onyeisi ndị ụlọomeiwu n'Imo steeti bụ Kennedy Ibe, akpọghachitela onye bụbu onyeisi ụlọomeiwu na steeti ahụ bụ Paul Emeziem achụpụrụ n'ọkwa ọrụ ya nwa mgbe nta. Akpọghachikwara onye nnọchịteanya mpaghara Isu state constituency bụ Ngozi Obiefule. Cheta na n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Nọvemba, 2021 na achụturu Emeziem na mmadụ atọ ndị omeiwu ọzọ n'okwa oche ha ma kwụsị ha ọrụ mgbe nta. E mere Ibe onyeisi ụlọomeiwu ahụ ozigbo achụturu Emeziem n'ọkwa. Ndị ọzọ achụturu n'ọkwa oche ha n'ụlọomeiwu ahụ bụ Okey Onyekanma na Ekene Nnodimele. Onyeisi ụlọomeiwu ahụ, onye kwụsịrịla ụfọdụ ndị ụlọomeiwu ọzọ ọrụ nwa mgbe nta kwuru n'ụbọchị Tuzde na akpọghachịtela Emeziem maka ọ rịọrọ mgbaghara n'ihe a sị o mere. Cheta na eboro ebubo na Emeziem metọrọ ọkwa oche ahụ oge ọ nọ n'isi ya. A kwụsịrị Obiefule ọrụ nwa mgbe nta n'ụbọchị 23 nke ọnwa Disemba, 2021 ma nye ọhere onye ọzọ ịnọchị ya. N'otu ụbọchị ahụ ekwepụkwara onye omeiwu Tochi Okere nke Ngor Okpala n'ọkwa oche ya ma nye ohere ka onye ọzọ nọchịe ya. Otu onye nọ onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ Samuel Iwuoha gbara ndị ntaakụkọ ama nke a n'ụbọchị Tuzde O kwuru: ""E wepụla nkwụsị ọrụ nwa mgbe nta enyere onye bụbu onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti bụ Paul Emeziem dịka ọ rịọrọ mgbaghara mmehe n'ihe a sị ọ mere n'ọkwa oche ahụ"" Onyeisi mgbasaozi n'ụlọomeiwu ahụ bụ Ifeanyi Onyekachi gbakwara onye ntaakụkọ BBC Igbo ama nke a. Ndị uweojii n'Enugu steeti ekwuola etu ndị ojiegbe amabeghị ndị ha bụ si wakpo ndị mmadụ n'ọdụ ụgbọala nke Christ Chemist n'Enugu n'ụbọchị Mọnde. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe kọwara BBC Igbo etu ndị ojiegbe ahụ siri jiri ụgbọala bọọsụ wụba ogige ọdụ ụgbọala nke Christ Chemist ma gba egbe ebe ahụ nke tụtara otu nwoke onye ma gbuo ya dịka eburu ya ga ụlọọgwụ. Ndukwe kwukwara na ndị ahụ gbara ụgbọala 'Sienna' nọ ebe ahụ ọkụ. Otu onye nọ ebe ahụ na-achọghị ka akpọọ aha ya kwuru na ndị oji egbe ahụ ji obere ụgbọala bọọsụ nke a na-akpọ 'mini bus' Bekee nyafete ebe ahụ n'isi ụtụtụ Mọnde ma kwụsị n'ihu Christ Chemist. O kwuru: ""Ngwa ngwa ha kwụsịrị ha lere ụgbọala 'Sienna' na ebu ndị mmadụ ebe ahụ malite gbawa ya egbe."" Ọ gara n'ihu kwuo: ""Ya bụ mgbọ gbagburu otu onye na-entinye ndị mmadụ n'ụgbọala nakwa otu onye njem."" Onye ahụ kwụkwara na ndị ahụ pụtara gba ya bụ ụgbọala ọkụ Sienna ọkụ. Mgbe BBC Igbo gara njem nleta ebe a sị ihe mere, a hụrụ na ebupụtala ya bụ ụgbọala Sienna ebe ahụ dịka ndị na-ebu ndị njem nọzị n'ọrụ ha ebe ahụ. Cheta na ụbọchị Mọnde bụ ụbọchị ndị bi n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ji anọ n'ụlọ n'ihi iwu onye nọrọ n'ụlọ nke a na-akpọ 'Sit at home' na Bekee bụ iwu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) hibere n'afọ 2021 n'ihi nwụchị gọọmentị Naịjirịa nwụchiri onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu n'ọnwa Juun, 2021. Ipob mechara kagbuo iwu a ma kwuo na ndị mmadụ ga-aga n'ihu n'anọ n'ụlọ ụbọchị ọbụla onye ndu ha bụ Kanu pụtara ụlọikpe. Ka ha si kwuo, nke a bụ iji gosi iwe ha nye gọọmentị Naịjiịrịa. Ọtụtụ mwakpo esorola ụbọchị kwa izu ọbụla n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjriịa dịka ndị otu ojiegbe dị ịcheịche ka na-amanye ndị mmadụ ya bụ iwu nke mere ndị mmadụ ji eji ụjọ anọ ụlọ. Ọtụtụ ụlọ��rụ, ụlọakwụkwọ, ndị njem nakwa ihe ngalaba ndị ọzọ n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa anaghịzị emepee ọrụ kwa ụbọchị Mọnde n'izu ọbụla maka egwu mwakpo. Mwakpo ndị a gụnyere: Mwakpo be ndị mmadụ, ntọrọ ndị mmadụ, mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii, mwakpo ụlọ nga, mwakpo ndị ọrụ nchekwa, mwakpo ndị ọrụ gọomentị dị ịcheịche, mwakpo na ịgba ọkụ nye be ndị mmadụ maọbụ akụnụba ndị mmadụ maọbụ ụgbọala ndị mmadụ. Gọọmentị Naịjirịa agbarụọla ihu etu ọnọdụ enweghị nchekwa si dị n'Ọwụwa Anywanụ Naịjirịa ugbua ma kwuo na ha na-agba mbọ idaju ọnọdụ ya bụ ihe. N'ọnwa Maachị 2022 mgbe ndị ojiegbe gbara be onyeisi otu Ohanaeze ndigbo bụ George Obiozor ọkụ, Onyeisiala Muhammadu Buhari katọrọ etu ọnọdụ nchekwa dị n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ma kwuo na aga ehibe usoro nchekwa ọhụrụ nye ndị mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Onye ọrụ nyocha sayensị aha ya bụ Ramirez Amaya Sebastin anwụọla dịka enyi zọgburu ya n'ogige ụmụ anụmanụ nke Kibale dị na mba Yuganda. Ngalaba 'Uganda Wildlife Authority (UWA)' kwuru na Ramirez na-arụ ọrụ na mahadum dị na mba Amerịka ma sị na ya na onye enyemaka ya na-eme nyocha mgbe ihe a mere. Ọnụ na-ekwuchitere UWA bụ Bashir Hangi kwuru sị, "" Ha biakwutere otu enyi nọ naanị ya, ya bụ enyi chụwara ha ọsọ nke mere ka ha gbapụ ọsọ ma si ụzọ dị iche iche. Kama enyi a chụrụ Sebastian zọpụya nsị ma zọgbuo ya"". Ngalaba UWA kwuru na nke a bụ mbụ enyi na-awakpo ma gbuo mmadụ kamgbe afọ iri ise (50yrs) e hiwere ogige Kibale. Cheta na enyi zọgburu otu nwoke onye Saụdi Arabia n'ogige ụmụ anụmanụ nke Murchison dịkwa na mba Yuganda n'ọnwa Jenụwarị. Kama enyi zọgburu nwoke a dịka ọ hapụrụ ụgbọala ebe ndị nlegharị anya kwesịrị ịnọ. Ukraine War: Otu European Union chọrọ ka Naịjirịa resi ha ikuku gaasị Dịka otu European Union (EU) na-achọ ịkwụsịlata mmekọ ha na mba Russia kamgbe ha bidoro ịwakpo mba Ukraine, ha abịakwụtela Naijirịa maka ịzụta gaasị n'aka Naịjirịaaasị. Naijirịa bụ mba nke anọ kachasị emepụta ma na-eresi mba ndị dị na Yurope gaasị. Ugbua Naijirịa ji pasenti iri anọ (40%) gassị ha na-emepụta agba mgbere n'ofesi. Nke a pụtara ihe dịka ndị nnọchiteanya EU gara n'ụlọọrụ Naijirịa na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ NNPC n'ịchafụ n'ụbọchị Mọnde. Samuela Isopi bụ onye nnọchiteanya EU na Naijirịa kwuru ""ọ bụghị naanị mgbere jịkọrọ anyị na Naijirịa, ụlọọrụ ndị ha na Naijirịa na-arụ ọrụ mmanụ agbidi bụ Yurop ka ha si cha"". Ebe ndị ụloọrụ NNPC na-ekwu na ha adịla njịkere iresi mba ndị nọ n'EU gaasị dịka ha siri chọọ. Naijirịa nwere gaasị e chekwaarala ruru 209.5 trillion cubic feet n'ọnwa Jenuwarị nke afọ 2022." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61078835 +health Coronavirus in Nigeria: Mmadụ ise ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa Mmadụ ise ọhụrụ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa. Ngalaba mgbochi ọrịa bụ 'National Centre for Disease Control' kwupụtara nke a n'ụbọchị Wenezde. Nke a pụtara na ndị butere ọrịa coronavirus na Naịjirịa eruola asatọ. Abụọ n'ime asatọ a agbakeela. Ụlọọrụ NCDC kwuru na mmadụ ise ọhụrụ mere njem gaa mba Briten maọbụ Amerịka. Ọbụghị n'aka onye mbụ bubatara ọrịa ahụ ka ha si bute ya. Ha kwukwara na ha na-agba mbọ ugbua ịchọpụta ndị niile ha na ndị ahụ mekọtara ahụ kamgbe ha lọtara. Nke a na-abịa dịka gọọmentị Naịjirịa machiri ndị si mba ebe coronavirus ka njọ ịbata na Naịjirịa. N'ọgbakọ 'Federal Executive Council' n'ụbọchị Wenezde ka a nọrọ nwee nkwekọrịta a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-51941033 +politics Independence day Nigeria : Naịjirịa na Amerịka dịka ndị dinta na-achụ otu anụ - Trump "Akụkọ dị mkpa: Trump ekelela Buhari na Naịjirịa Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump eziterela onyeisiala Muhammadu Buhari ekele ọma maka ncheta ụbọchị nnwereonwe Naịjirịa bụ ụbọchị mbụ ọnwa Ọktoba. N'ozi ya, Trump sị na Naịjirịa na Amerịka dịka ndị dịnta abụọ na-achụ otu anụ ọhịa n'ụzọ dị iche iche. Ọ sị na Naịjirịa na Amerịka bụ enyi n'ibu agha megide iyi ndụ egwu n'ụwa dịka Boko Haram, ISIS na ndị ọzọ. Trump sị na mba Amerịka dị njikere ịnabata atụmatụ ọchịchị Buhari n'ụzọ ga-enye aka iwulite mba abụọ ndị a. Ọgbaaghara dara n'ụlọomeiwu ndị Bayelsa Ụda egbe na ọgbaaghara bụ ihe e ji gbasaa nzuko ndị ụlọomeiwu Bayelsa Steeti mere dịka ndị omekaome gbabatara n'ụlọomeiwu ahụ. Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị omeiwu chọrọ ịchụtu onyeisi ha bụ Tonye Isenah , onye a sịrị chọrọ ịgba arụkwaghịm. N'egwuregwu Manchester United ga-ele ndị Arsenal ọbịa n'Old Trafford n'asọmpi Premier League nke abalị a. Ndị ọgba bọọlụ dịka Anthony Martial, Marcus Rashford, Alexandre Lacazette agaghị agba n'ihi mmerụ ahụ. Nkeji Agbagbuola onye uweojii n'Abia Steeti Ndị uweojii nọ n'Aba ekwuola na ha ka na-enyocha ka ha mara etu ndị ogbe ezu si gbuo onye otu ha. Akụkọ pụtara n'ụbọchị Sepụtemba iri abụọ na asaa kwuru ndị oji egbe ezu wakporo ndị uweojii atọ na-eme nchekwa ngagharị gbuo otu,meruọ otu ahụ ebe onye nke atọ gbalagara. Ndị oji egbe ezu ahụ jịkwa egbe ndị uweojii ahụ gbalaga. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ na steeti ahụ bụ Geoffrey Ogbonna gwara BBC Igbo na ya bu ihe mere mana ha ka na-enyocha ka ha mara ka mmiri si baa n'opi ugbogiri. Anyị ga-ewetere ụnụ nchọpụta ha n'uju dịka ha kwere na nkwa ịgwa anyị ma ha mecha. Ụlọọrụ Department of State Services (DSS) akọwala na onweghi mgbe ha ji nwụchi Chido Onumah bụ onye ntaakụkọ na-akatọ ọchịchị ọjọọ ma kwuo na ọ bụ ịtụziri ya aka ka ha mere. Ọnụ na-ekwuchitere ngalaba a bụ Peter Afunanya kwuru na ọ bụ n'ihi efe o yi edere ""anyị niile bụ Biafra"" na ya bụ ihe kpatara okwu a. Cheta na aakụkọ pụtara ụnayhụ na ndị DSS nwuchiri ya bụ nwamadi ụnyahụ ka ọ 'tụrụ down' n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe International airport dị n'Abuja. Ha mechara wepụta akwụkwọ ozi gosiri na ọ bụ mkparịtaụka ga-eme ka akwa Onumah ghara ibutere ya nsogwu nakwa ụmụ Naịjirịa. Ha kwuru na ụlọọrụ ha na-eme ihe ọbụla iji hụ na ha adaghị iwu Naịjirịa. Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo ekwuola na na-agbanyeghị nsogwu niile Naịjirịa na-enwe , o nwere okwukwe maka Naịjirịa ọhụrụ ga ha pụta. O kwuru nke a n'ụka a akara ụnyahụ iji malite emume ụbọchị ncheta nwereonwe nke Naịjirịa nke ugboro iri ise na itoolu. Ihe karịrị mmadụ narị anwụọla na mba India n'ihi oke ide mmiri na steeti Uttar Pradesh nakwa Bihar. Ihe ndị ọzọ ide mmiri a metụtara bụ njem ụgbọala, ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ, ị ga ụlọakwụkwọ nakwa ọkụ latrik. N'egwuregwu, Minista na-ahụ maka egwuregwu na mwulite ndị ntorobia bụ Sunday Dare enyela iwu ka akpọghachi onye na-elekọta ndị ọgbọsọ Naịjirịa bụ Sunday Adeleye. Ọ bụ n'ihi emetaghị ọrụ ya ọfụma nakwa ịda iwu IAAF ka eji kpọghachi Adeleye. Nkeji Ihe nkiri a ga-amasị gị" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49869001 +health Coronavirus Tips: Ọbụghị eziokwu na ndị ntorobịa enweghị ike ibute ọrịa coronavirus Ọtụtụ na ekwu na coronavirus bụ ọrịa ndị okenye, nke na ndị ntorobịa ọbara ha dị ọkụ agaghị ebute ya. Onye gwara gị? Coronavirus egbuola ma ndị okenye, ma ndị ntorobịa, ma nwata a mụrụ ọhụrụ. Ya mere ụzọ kacha mma bụ ichekwa onwe gi. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Chimezie Ucheagbo na Chiemela Mgbeahuru Peter https://www.bbc.com/igbo/afirika-52237203 +health Ndị dọkịnta isi ekwuola na isimgbaka, abụghị mmụọ ọjọọ na-ebute ya Ndị dọkịnta na ndị ọkachara mara ọrịa metụtara ụbụrụ nke Federal Neuro-Psychiatric Hospital na Yaba, Legos akpọọla oku ka ndị ọrụ ntaakụkọ na ndị na-eme ihe onyonyo na-etinye uche n'ụdị ozi ha na ewpụta banyere ọrịa isi. Ha kwuru nke na ọgbakọ ha nwere n'ogige ha ụbọchị Tuzde. Dọkịnta Nworia Chukwudi kwuru na etu ndị ntakụkọ sị akọwa okwu ndị ọrịa isi na-eme ekwesịghị ekwesi n'ịhị na ọ na-eme ka a na asọ ndị ahụ asọ. N'otu aka ahụ, Dọkịnka Nwakire Chinwe kwuru na ọbụghị ezi okwu na-adịghị agwọ ara maọbụ ọrịa isi agwọ. Ha dọrọ ndị ihe nkiri Nollywood ọdụ ka ha na-eme nchọpụta tupu ha mee ihe nkiri Metụtara ndị na-arịa ọrịa ụburu iji gbanahụ iduhie ọha mmadụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-46817812 +business Electricity Subsidy removal: Ihe ndị ị maghị maka ego nkwubilata ọkụ latrik gọọmentị wepụrụ "Na nso nso a, ụlọ rụ na-ahazị okwu ọkụ latrik na Naijiria a kpọrọ 'Nigerian Electricity Regulatory Commission'(NERC) na Bekee kwuru n'ezie, na e wepụla ego 'subsidy' n'ọkụ latrik na Naijiria. Onyeisi ụlọọrụ Nerc bụ Sanusi Garba, onye gbara ama n'Abuja kwuru na a ga-na-agbanwe ihe a na-akwụ maka ọkụ kwa ọnwa isii. Ozi a nke na-abịa dịka Naijiria na-enwe nsogbu enweghị ọkụ ma ncha abalị abụọ, gbagwojuru ọtụtụ ụmụ Naijiria anya nke mere ka ọtụtụ na-ajụ ihe nke a pụtara. Na nkọwa ya, Sam Amadi bụ onye bụbu onyeisi NERC(2010-2015) kọwara BBC Igbo na gọọmentị na-etinyebu aka n' kwụbilata ego latrik iji mee ka ọkụ latrik bụrụ ihe ndị ogbenye ga na-enweta, O kwuru na ọkụ latrik dịka onye na-eme achịcha nke na-az��� akọrọngwa dị iche iche gụnyere shuga, flawa, na ihe ndị ọzọ bụ nke ọ na-agbakọ ma tinyetụ ọmụrụnwa were ree. ""Iji hụ na-ahịa ahụ na-aga n'ihi, onye ahụ kwesịrị ị na-etinye nwa ego n'elu ego akọrọngwa o tinyere were mee achịcha ahụ."" Ndị na-ewetara anyị ọkụ ya bụ ndị ""Gencos' bụ mmanụ gaasị ka ha na-eji eme ya. Ha na-azụ ya azụ.Ha nwekwara ihe ndị ọzọ ha na-etinye iji nye ndị Discos ọkụ."" Lee ihe ndị ọzọ o kwuru maka iwepụ ego nkwụbilata gọọmentị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-60798946 +entertainment Queen Elizabeth: Eze Nwaanyị Ịngland sị na ọ kwadọrọ Harry na Meghan ịnọrọ onwe ha "Eze Nwaanyị Ịngland bụ Elizabeth ekwuola na ya na ezinaụlo ya nabatara Nwaeze Harry na nwunye ya bụ Meghan ị were oge wee nọrọ ọnwe ha ma sị na ọ ga-amasị ha ma ha abụọ na-ebi ma na-arụ ọrụ dịka ndị obieze Ingland. Ọ bụ na mba Kanada na Briten ka a na-atụanya na ha ga-anọ. Ụlọikpe Ukwu nke Naịjirịa ekwuola na ọ bụ n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Janụwarị ka ọ ga-ekpebi ikpe banyere ntuliaka eji hopụta aka ga-achị Imo steeti site afọ 2019 ruo afo 2023. Ọ bụ taata bụ ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Janụwarị ka ekwesiri ikpe ya bụ ikpe tupu ebugharịa ya ruo eche. Hope Uzodinma nke APC na-arịọ ulọikpe ikpe ahu ka ọ kagbuo mmerị Emeka Ihedioha meriri iji bụru Gọvano Imo steeti. Okwu onye ga-achị Kano na Sokoto steeti sokwa n'Ikpe kwesiburu ukpebi taa. Lee etu ọnụọgụ vootu ntuliaka a siri kwụrụ oge agbakọchara ya ebe a. Otu onye tinyere ọnụ n'okwu mere ojiri dịrị ọkụ bụ Ụkọchukwu Mbaka buru amụma na ""Hope n'abịa n'Imo"". Gụọ maka ihe Mbaka kwuru ebe a: Amụma Mbaka maka Hope Uzodinma, Buhari ekwuola okwu, bịa gere ozi ndị ọnụ na-eru n'okwu. Lee oge otu onye na-akwado PDP na onye nke pati ọzọ dọkara akwụkwọ eji agbakọ ọnu ọgụ vootu. Ndị uwe ojii Imo steeti adoola ndị Imo aka na ntị Dịka ụlọikpe kachasị na Naijirịa ka ekpebi ikpe maka ntụlịaka Gọvanọ Imo steeti n'ụbọchi iri na anọ nke Jenuarị afọ a,ndị uweojii adọọla ndị Imo steeti aka na ntị ma sị ka mmadụ niile kwanyere ọnwe ha ugwu. Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Ikeokwu Orlando kwuru nkea na akwụkwọ ha depụtara ma sị na ha dị njikere ichekwa steeti ahụ na-agbanyeghị otu ikpe siri gaa. Omeiwu Enyinnaya Abaribe kwuru sị na nsogbu anyi na Naijirịa bụ na ọ di ka amụtaghị ihe na agha Biafra. Ọ bụ n'ọgbakọ maka ncheta Agha Biafra akpọrọ 'Never Again' nke e mere na Legos ka okwuru nke a. O kwukwara na dịka Naijirịa nweziri steeti iri atọ na isii ụgbụa, na agha ọzọ ga-ebute otutu ihe mgbu na ọgba aghara karịa nke agha Biafra. Ndị omekome egbuola ndị nkuzi atọ ma tọrọ otu n'ime ha n'obodo Garissa nke dị na Kenya. Enwebeghị ndị sị na ọ bụ ha kpara mkpamkpa a kama ndị otu Al Shabab na awakpo ndị mmadụ kemgbe na mba Kenya. Ị nwere ike tie mkpu maka akụkụ nke a, dịka ngalaba na-ahụ maka nrị na ọgwụ na Amerịka nyere ndị na-emepụte ọgwụ akpọrọ Ervebo ikike ịga n'ihu malite imepụta ya. Ervebo bụ ọgwụ mgbochi ajụ ọrịa akpọrọ Ebola ga-erere ndị dị afọ iri na asato gawa. Ndị Iran na-eme ngagharị iwe nke ụbọchị abụọ maka mgbatu ndị agha ha gbaturu ụgbọelu Yụkren nke mmadụ otu narị na iri asaa na isii nwuru n'ime ya. Ha na-akọwa na iwe ha bụ na ndị be ha gbajọrọ ịmechi mfepu ụgbọelu dika ha tụchara ogbunigwe na ọdọ ndị agha Amerịka dị na Ịrak. Oji ego achụ ego ama ama bụ Aliko Dangote ekwuola na ya nwere ike ịzụta otu egwu bọọlụ Arsenal n'afọ 2020 ma ya hiwesie ụlọorụ ọ chọrọ ihiwe. Anyi na ajụ; Onye nzọpụta Arsenal ọ ga-abụzị onye Naijirịa. Ọ bụ n'izu a ka a na-eme ncheta ngwụcha agha Biafra. Ọ bụ n'ụgbọchị iri na ise nke ọnwa Janụwarị ka agbara egbe ịkpeazụ nke ejiri suo kpọm na ya bụ agha. Mka nke a, BBC Igbo ga-amalite taata na-ewetere unu ọtụtụ ihe nkiri nakwa akụkọ maka Biafra. Ga na BBC Igbo dọt Kọm ka ịmata nke na-eme" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51087853 +entertainment Tiwa Savage na Yemi Alade a na-akọ ọnụ otele? "Akụkọ dị mkpa Akụkọ na-efegharị na soshal midia bụ na Tiwa Savage na Yemi Alade na-ekpere onwe ha ikpe banyere onye otele ya ka ibu. Yemi Alade bulitere okwu oge o dere na Twitter ya na ""Ọ bụghị ime ka otele gị dịka ka oburu na foto, Ị ma na ị dịka akara edemede 'I'. Kwụsị ịghọgbu ndị ihe gị na-amasị. Were onwe gị ka chi gị ssi kee gị."" N'otu aka ahụ, Tiwa jikwara ikpe saa ya. Tiwa gara n'ihu gwa ya ka ọ ghara ibido ọgụ ọ gaghị alụchali. 'Ọgụ' ahụ butere ndọrịtaụka n'etiti ndị ihe ndị otiegwu abụọ ahụ na-amasị. Ebe ụfọdụ kwunyere Tiwa, ndị ọzọ kwụnyere Yemi. @Terrybrainz kwuru na Yemi na-eghu Tiwa anyaọkụ kemgbe. @Bigstan82745069 kwuru na Yemi Alade ka Tiwa Savage eewu na mba ofesi ọkachasị n'Afrịka, na otele ya kakwa nke Tiwa Yemi Alade mechara rịọ mgbaghara maka ihe a odere, ma si na ọ bu ndụmọdu ka ya na-enye ndị mmadụ. Ọkụ agbala mmanụ na-ebu mmanụ na nso Maryland Bridge dị na Legos. O nweghị onye ma ihe butere ọkụ ọgbụgba ahụ mana o mere ka ahịrị ụgbọala karia n'okporoụzọ gawara Ọjọta na Ketu dị na Legọs. Ndị a na-eche na ha na-arụrụ gọọmenti Imo steeti ọrụ kpọchiri ama egwuregwu Dan Anyiam dị n'Owere ebe e hiwere mmalite ọsọ achụmnta vootu Hope Uzodinma. Ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo n'ekwentị, o kwuru na Uzodinma etinyeghị akwụkwọ iji nata ikike iji ama egwuregwu ahụ mee ihe n'aka Kọmịshọna ọ dị n'aka. Ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka bụ EFCC mpaghara Enugwu anwụchiela mmadụ abụọ bu nde dọla abụọ n'ụma ụbọchị Tọsde na ọdọgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu. Ndị uweojii mba Spain na ndị obodo Catalonia ndị na-achọ nnwereonwe site na spain kwatara na Barcelona. Ndị Catalonia ndị na-emem ngagharịiwe tụrụ ndị uweojji okwute,ebe ndị uweojii siri okporo saa ha. N'egwuregwu, Onye bụbụ onye ndụ otu bọọlụ Manchester United bụ Roy Keane akatọla agwa ndị egwuregwu otu ahu kpasara Jose Mourinho. Keane sị na agwa ha kpara tupu a chụọ Mourniho bu ihe mechụ ihu. Ọ sị na nke a gosiri na ha abụghi ndị zuru ka eme. Ndi omekome awakpola ime obodo na Zamfara Akụkọ sị Zamfara na-akọwa na ọtụtụ mmadụ nwụrụ mgbe ndị omekome wakporo ime obodo atọ na steetị ahụ. Mwakpo a mere na n'okpuru ọchịchị ime obodo Birnin Magaji. Ndị bi ebe ahụ kwuru na ọtụtụ mmadụ nọ n'ugbo ha mgbe ajọọ ihe a bịakwutere ha. N'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, Onyeisi ndị Omeiwu Naịjirịa bụ Bukola Saraki akatọla bọọjetị Onyeisiala Muhammadu Buhari nyere ya na ndị otu ya ụbọchị Wenesde. Saraki sị na ya bụ ihe Bekee kpóró Budget 2019 agaghị enyere Naịjirịa aka. Ka nke a na-eme, onye bụbụ osote gọvanọ na Kano edurula ụfọdụ ndi na-akwado aka chịbụrụ Kano steeti bụ Rabiu Kwankwaso laghachi APC. Hafizu Abubakar na ndị otu ya so kwankwaso gbaga PDP n'afọ a, mana ha ekwughi ma ọ ga-eso ha n'azụ na nlaghachi a. N'ofesi, Onye odeakwụkwọ Amerịka n'ihe banyere nchekwa bụ Jim Mattis etinyela akwụkwọ arụkwaghịm Mattis sị na ya mere nke a makana echiche ya gbasara etu Amerịka na mba ofesi ga-emekọta adabaghị. Ihe na-eme ka Trump si ndị agha Amerịka nọ agha na mba Sirịa lọta. N'egwuregwu, Super Eagles nke NaỊjirịa ka bụkwa ndị nke iri anọ na anọ n'ụwa. Nke gosiri na ha apụghi n'ọkwa ha no n'ọnwa Ọktoba. Eagles bụ ndị nke anọ n'Afịrịka ka Senegal ka tụrụ ugo dịka ndi nke mbu n'Afịrịka. Gee akuko a ebe a: Ihe nkiri taa:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-46629928 +health Covid-19: Davido sị na chioma ebutela Coronavirus "Akụko na-eme ugbua bụ na Chiooma nwunye nwa ya ebutela coronavirus. Davido kọwara na ọ bu dịka o si njem Lọndọn lọta were mee nyocha ka ha chọpụtara na Chioma bụ coronavirus. Nwa ha nwoke ebughị ya bụ ọrịa. O kwuru na-ahu siri Chioma ike dịka o dopụrụ onwe ya ma na anata ọgwụgwọ. Onyeisiala mba Gana bụ Nana Addo Dankwa Akufo-Addo enyela ikike ka atọghapụ mmadụ narị asatọ na asatọ ndị nọ n'ụlo nga ka ha laa ụlo ha maka nchekwa ọrịa Coronavirus. Mmadụ narị asatọ na asato a bụ: Dịka ọ dị ugbụa, mmadụ otu narị na iri atọ na isii, ebe mmadụ anọ anwụọla. Gọvanọ Rivas steeti bụ Nyesom Wike agbaala ama na onye mbụ butere ọrịa Coronavirus na Rivers steeti bụ nwa aghọghọ gbara afọ iri na itolu si njem mba Fransị,gaa Itali na Griisi tupu ọ bata Pọtakọt n'ụbochi iri na isii nke ọnwa Maachị. Wike kelekwara nwa agbọgho a etu o siri dopu onwe ya ma etu o siri nyere gọomentị aka. Ugbua a ga-amachi azụm ahịa sịte n'ụbọchi iri abụọ na asatọ na Rivas steeti niile. Lasaa Fever egbuola mmadụ 176 n'afọ 2020 Dịka Coronavirus na-eyi mba ụwa egwu ma na Naijirịa, Lassa Fever na awakpo kwa ndị mmadụ. Ugbua enweela mmadụ iri abụo na asatọ bụ ya bụ ọrịa na nso nso a, ebe mmadụ atọ nwụkwara nsonso a. Dịka ngalaba na-ahụ maka nje na ọrịa kwuru na ha chọtara mmadụ isii sị ụgbo mmịri bata Naijirịa bụ ọrịa coronavirus, ngalaba na-ahu maka njem ụgbo mmịri sị na ha amaghị maka ya. Ihe onyonyo si n'akara Facebook onyeisi ụlọọrụ Anambra Broadcasting Service bụ Uche Nworah gosiri etu e si chụsasịa ndị gbakọrọ maka emume akwamozu n'Ojoto. Cheta na gọọmenti Anambra steeti machiri emume dịka agbamakwụkwọ nakwa olili ozu iji belata mfesa ọrịa coronavirus. Kirie ya n'uju ebe a: 'Boris Johnson Praịm Mịnịsta Briten ebutela ọrịa coronavirus Praịm Mịnịsta mba Briten bụ Boris Johnson ebutela ọrịa coronavirus. Ugbua ọ ga-anọpụ iche ma na-anata ọgwụgwọ. Ọbụ onyeisi ndị dọkịta mba Ịngland bụ Cgris Whitty nyere Boris Johnson ndụmọdụ ka ọ ga mee nnyocha. Johnson ji ọnụ ya kwupụta na ya nwere ọrịa a. Ndị uweojii n'Anambara arịọla ka ndị mmadụ kwụsịtụ iweta mkpesa n'ụlọọrụ ha iji zeere mmekọ mmadụ na ibe ya nke nwere ike ibte mgbasa ọrịa coronavirus. Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii kọwara na nke a bụ iji rube isi na ntụziaka nke onyeisi ha bụ Mohammed Adamu nyere. Mohammed rịọkwara ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ dịka gọọmentị Anambara si kwuo. O kwuru sị: ""Ndị uweojii na-agagharị iji hụ na iwu gọọmentị nyere mịtara mkpụrụ."" Ụlọikpe kachasị atụfuola ikpe ndị pati 'All Progressives Congress' nke Zamfara steeti gbasara ntuliaka ọkwa gọvanọ steeti ahụ e mere na 2019. Ọkaikpe Iyang Okoro bụ onyeisi ndị ọkaikpe kpere ikpe ahụ kwuru na 'supreme court' enweghị ikike ikwugharị ihe ha kwuburu. Cheta na ụlọikpe kachasị chụpụrụ ndị APC na ntuliaka ọkwa gọvanọ n'ihi na ha emeghị ntụliaka praịmarị oge o kwesịrị. Mana ndị APC weghachiri ikpe ahụ ka ụlọikpe kachasị lebagharịa ya anya. Ọkaikpe Inyang Okoro na ndị ọkaikpe anọ ọzọ kwenyere na ha enweghị ikike ikwugharị ihe ha kwuburu. N'aka nke ọzọ otu onye ọkaikpe aha ya bụ Centus Nweze ekwetaghị n'ihe ndị otu ya kwuru. Nweze kwuru na ikpe ahụ kwesịrị ka e labagharịa ya anya. Ọnụọgụgụ ndị nwere ọrịa coronavirus na mba Amerịka akarịala nke mba Chaịna bụ ebe ya bụ ọrịa si malite. Ugbua ọnụọgụgụ ndị na-arịa coronavirus n'Amerịka akarịala 85,500, nke Chaịna dị 81,782, ebe nke Ịtali dị 80,589. Mana ọ bụ n'Ịtali ka ya bụ ọrịa kacha gbuo mmadụ. Ndị ọrịa a gburu na Ịtali dị 8,215 mana ndị o gburu na Chaịna dị 3,291. Ọtụtụ steeti na mba Amerịka kpọchiri akpọchi ugbua iji gbochie mgbasa ọrịa coronavirus. Onyeisiala Donald Trump kwuburu na ya chọrọ ịkpọghe ebe niile n'ọnwa na-abịa abịa, mana nke a adịghị ka ọ ga-enwezi isi ọzọ. Mba Saut Afrịka emechiela obodo ha niile kpamkpam malite n'elekere 12 nke isi ụtụtụ ụbọchị Fraịde. Nke a bụ ụzọ iji gbochi mgbasa ọrịa corona na mba ahụ. Ihe karịrị mmadụ narị itoolu nwere ọrịa coronavirus na Saụt Afrịka, mana onwebeghi onye nwụrụ. Onyeisiala Cyril Ramaphosa kwuru na ya bụ mmechi obodo rara ahụ kama ọ dị mkpa iji zọọ ndụ ndị mmadụ Ụmụ Naịjirịa na soshal midia na-ekwu na ọ dịka ihe na-eme na Naịjirịa agbasaghị onyeisiala Muhammadu Buhari. Nke a mere ka ha na-ajụ sị ""ebee ka Buhari nọ?"" Mana ọnụ na-ekwuru Buharị bụ Femi Adesina kwuru na Buharị agbaghị nkịtị, kama na ọ bụ etu o si chọọ. Adesina kwuru nke a oge onye ntaakụkọ Channels TV gbara ya ajụjụ ọnụ n'abalị Tọzde." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52060528 +politics Presidential Elections: Ụlọikpe akụpụla ikpe na Buhari agụrughị akwụkwọ ịbụ onyeisiala "Akụkọ kachasị dị mkpa n'ụbọchị Fraide, abalị iri na abụọ nke ọnwa Julaị: Ụlọikpe Mkpegharị dị n'Abuja nọrọ n'ụbọchị Fraide kụpụ n'akụkụ, akwụkwọ a gbara na-ekwu na Buhari agụrughị akwụkwọ ịbụ onyeisiala na ntuliaka 2019. Na mkpebi ụloikpe nke ọkaikpe atọ n'isi ya Jọstis Mohammed Idris kwuru na a gbara akwụkwọ ahụ mgbe ọ gaferela oge kwesịrị ka e weta ya bụ okwu n'ụlọikpe nke bụ abalị iri na anọ. Kalu Kalu, Labaran Ismail and Hassy El-Kuris gbaburu akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja iji gbaghaa na Buhari etozughị ịbụ onyeisiala. mana ụlọikpe ahụ kụpụrụ ya, ha were gbagharịa akwụkwọ ahụ n'ụlọikpe mgbegharị. N'aka nke ọzọ, ""Ezipụrụm mpụtara ntuliaka gaa 'server'"" Onye ọrụ Inec ọzọ agbaala akaebe na ya zigara mpụtara ntuliaka 2019 na 'server' n'oge ntuliaka onyeisiala Naijiria e mere n'ọnwa Febuwari afọ 2019. Olufemi Ogunride, onye so na ndị ọrụ ngo Inec jiri rụọ ọrụ kwuru na ""Ihe m ma bụ na presiding Officer wetara akwụkwọ EC8C Form nke m lere anya were debanye akara site n'igwe 'card reader' banye na 'server'."" Cheta na otu pati PDP rịọrọ ụlọikpe arịrịọ ka e nye ha ikike inyocha 'server' dịka ha na-ebo ebubo na Inec nwogharịrị mpụtara ntuliaka 2019 iji nye Buhari mmeri. 'Nyeenu UNN nkwado imepụta ụgbọala latrik n'ụbara' Otu jikọrọ ndị ntorobia n'Ọwụwa-Anya a kpọrọ 'Coalition Of South East Youth Leaders' akpọkuola gọọmenti etiti ka ha nye mahadum 'University of Nigeria Nsukka' nkwado ego iji emepụta ụgbọala latrik na-enye ọk�� n'ụbara. Mbeku a na-esote mmepụta ụgbọala latrik na-enye ọkụ nke Engineering Department nke mahadum ahụ mepụta na nsonso a. Mbeku ahụ dị n'akwụkwọ ozi otu ahụ zitere BBC Igbo ụbọchị Fraide nke onyeisi ha bụ Goodluck Egwu Ibem binyere aka. Ha rụtụrụ aka mkpa ọ dị ka gọọmenti kwado mahadum na imepụta ụgbọala ahụ ka o juo eju bara abara na Naijiria nakwa maka mbupụ na mba ndị ọzọ. Ha kpọkwara oku ka gọọmenti etiti nye mahadum'University of Nigeria Nsukka' ohere inwe ngalaba 'Chemical Engineering.' ""Na Naijiria e nwere mahadum ọkaibe nke mpaghara atọ; 'University of Lagos'(Unilag), 'Ahmadu Bello University' (ABU) na ""University of Nigeria Nsukka(UNN). Nke UNILAG na ABU na-akụzi Chemical Engineering mana e nyeghị UNN ohere ịkuzi Chemical Engineering."" ""Ihe ọbụla bụ ihe kpatara nke a, anyị na-akpọku gọọmenti ka onye ohere ka mahadum a bido kụziwe 'Chemical Engineering' iji kwado ọganihu teknụzụ na Naijiria."" Ogbunigwe egbuola mmadụ itoolu gụnyere nwatakịrị Ihe ọjọọ mere n'ofesi dịka ndị omekataraihepụọụjọ yinyere nwatakịrị ogbunigwe gburu mmadụ itoolu na mpaghara Nangarhar dị na mba Afghanistan. Ihe a mere ebe a gara agbamakwụkwọ merụkwara mmadụ iri na abụọ ndị ọzọ ahụ. Ihe mere n'ogige Pati PDP Akụkọ si n'ọnụ Ọkaiwu Livy Uzoukwu bụ onye du ndị ọkaiwu otu pati People Democratic Party (PDP) na-akọwa na ndị obu egbe wakporo ndị kwesịrị ịgbara Atiku Abubakar na Peter Obi akaebe n'ụlọikpe. PDP sị na ihe a mere ka Ọkaikpe Mohammed Garba yiharịa ụbọchị ikpe ha ruo Monde bụ ụbọchị iri na ise nke ọnwa a. Ndị Shịa nọ ụlọikpe Ndị uweojii Naịjirịa akpụpụla mmadụ iri isii na ise bụ ndị otu ofufe Shịa ụlọikpe dị n'Abuja maka ebubo mwakpo, ịkpa nkata mpụ nakwa ịgbakọ n'ụzọ ezighi ezi. A nwụchiri ha mgbe ha na-eme ngagharịiwe maka onyeisi ha bụ Ibrahim El-Zakzaky gọọmentị etiti Naịjirịa ji eji. Griezmann agaala Barcelona Ndị na-akwado Barcelona amalitela ịkpa nganga dịka ndị isi ha gotere Antoine Griezmann. Griezmann so ndị France bulie Iko Mbaụwa n'afọ 2018 abụrụla onye isii ego e ji zụọ ya kacha dị ọnụ n'ụwa, dịka Barcelona kwụrụ paụnds otu nde narị na asaa iji gote ya. Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na nnukwu ọkụ dị ya n'ike ugbua maka ịhọpụta ndị mịnịsta ga-eso ya rụọ ọrụ. Buhari kwuru nke a oge ya na ndị omeiwu ụfọdụ riri nri abalị ụnyaahụ n'Aso Rock dị n'Abuja. Ọ kọwara na ihe o ji dị ka ọ na-egbu oge ịhọpụta ndị mịnịsta bụ maka na ọ chọrọ ịhọrọ ndị ọ ma n'onwe ya na-abụghị ndị pati ya bu APC ga-ahọpụtara ya. A na-ele anya na Buhari ga-ewepụta aha ndị ga-eso ya rụọ ọrụ dịka Minista. Aka chịburu Naijiria bụ Goodluck Jonathan ka na-ekwusi ike na nsogbu Naijiria niile ga-ala kpam kpam ma ọ bụrụ na e mee ihe niile ekwekoritara na ọgbako confrensi nke 2014. Jonathan kwuru nkea n'otu ọgbakọ na Legọs unyaahụ bụ abalị iri na otu nke ọnwa Julaị. Ọ kọwara na mgbe emechara ya bụ ọgbakọ na 2014, oge adighịrị ya iji tinye nkwekọrịta ndị ahụ n'ọrụ n'ihi na oge ntuliaka atụnyela n'ụkwụ. Na mba ofesi, Onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump ekwuola na ọchịchị ya ga eso ụzọ ọzọ iji chọpụta mmadụ ole bi na Amerịka bụ ndị si mba ọzọ wee bịa. Ụlọikpe ukwu Amerịka machiri Trump itinye ajuju gbasara obodo mmadụ si mgbe a ga-eme ọgụgụ ọnụ nke afọ 2020. Mana Trump na ndị pati ya bụ 'Republicans' kwuru na ha ga-esi ụzọ ọzọ wee nweta ọnụọgụgụ ndị mbiara mbiara ole bi n'Amerịka maka na ahụghị ka e mere, e mee ka a hụrụ. N'egwuregwu bọọlụ, ọ ga na-ada ""jiria jiria"" ụbọchị ụka mgbe Nijiria ga-ezute Ọljiria n'agba abụọ nke ikpeazụ nke asọmpị iko mba Afrịka. Mba Ọljiria jiri ọkpụ goolu penariti anọ asatara atọ wee dulaa ndị Aịvọrị Kost ụnyaahụ. Iji wulite mmụọ ha, ndị ogaranya abụọ bụ Aliko Dangote na Femi Otedola ekwela ndị Super Eagles nkwa ibunye ha ego n'ụkpa ma ha merie ya bụ asọmpi. Mba Senịgal ga-ezute ndị Tunisia na asọmpi 'semi-final' nke ọzọ. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48961685 +sports Premier League table: Chelsea na Manchester United azọọla Leicester City ụkwụ n'isi wụfere Manchester United na Chelsea ga-eso agba Champions League nke afọ 2020/2021 dịka Premier League nke afọ a pịachiri taa. Goolu abụọ asataghị otu Man Utd ji merie Leicester City, na abụọ asataghị otu Chelsea ji merie Wolves, mere ka nke a dị ire. Man Utd pịachiri afọ a n'ogogo atọ na tebulu, ebe Chelsea gbazịrị onye anọ. N'agbanyeghi na ha abụọ nwechara pọịntị 66, Man Utd ji ndịiche goolu gafere ha. Ndị nyerela Man Utd goolu bụ Bruno Fernandes ji penariti VAR kwuru na ọ dabara, nye goolu na nkeji 71, tupu Jesse Lingard emezuo ya abụọ na nkeji 90 na ụma. Ebe Mason Mount nyerela Chelsea goolu nke mbụ na nkeji 45. tupu Olivier Giroud atụkwasị ya nke abụọ na nkeji 45 na ụma. Lee etu e si kwụrụ n'ahịrị na tebulu Premier League mgbe a pịachiri taa. Jamie Vardy nyere goolu 23 na Premier League n'afọ a, nke mere ka ọ bụrụ onye ritere akpụkpọụkwụ olaedo a na-enye onye kacha nye goolu n'otu afọ. Nke a mere Vardy dị afọ 33 onye kacha kaa nka riterela nturugo a. Ederson nke Manchester City ritere mgbanaka ọlaedo dịka a na-enyeghi ya goolu n'egwuregwu 16 n'ime 38 a gbara. https://www.bbc.com/igbo/afirika-53533398 +health Fertility Boosters: Ihe 5 nwaanyị kwesịrị ime iji tụrụ afọ ime Nwaanyị lụ ha na dị, ihe ọzọ ụwa na-atụ anya ya bụ afọ ime. Nke a bụ makana nwa bụ ihe ọṅụ nye ezinaụlọ ọbụla ọ batara. Lee ihe dọkịta kwuru ga-enye ụmụ nwaanyị aka tụrụ ime: https://www.bbc.com/igbo/afirika-56387151 +entertainment Maternal Mortality: Uche Jombo na ụmụnwaanyị ndị ọzọ kwuru ihe mere ha agaghị amụju ụlọ "Ụfọdụ ndị ọkachamara na-eche na ịkwụsị atụmaatụ ebe ụmụnwaanyị na-achọrịrị ka ha mụta nwa nwoke nwereike belata ụmụnwaanyị ịnwụ ebe ha na-amụ nwa. Uche Jombo kwuru na ọ dịghị ka ụmụnwaanyị na-achịpụta ụmụ iri na abụọ maọbụ itoolu dịka nne ya si mee. Jombo kwuru na ịmụta nwa na-ara ya ahụ; na afọ ime ya pụrụ ugboro atọ. Ibukun Ogu ji ụmụ atọ kwuru na o bu ụzọ mụta ụmụnwaanyị abuọ tupu ọ mụta otu nwoke mezuru ha ụmụ atọ. Mana o kwuru na ya na di ya kwetara ịmụta ụmụ abụọ sọsọ mgbe ha lụchara di na nwunye. Otu nwaanyị na-achọghị ka a mata aha ya kwuru na ya mụrụ ụmụ anọ ebe ọ na-achọ ịmụta nwa nwaanyị. O kwuru na o ji ịwa afọ mụọ ha niile nke mere ka di ya were ụjọ sị ya amụzịla ka ọ mụchara nke atọ bụkwa nwoke, mana o siri ọnwụ mụọ nke anọ mechara bụrụ nwa nwaanyị ọ na-achọ kamgbe. Ihembosi dị afọ iri atọ na asaa mụrụ nke mbụ, ọ bụrụ nwoke, nke abụọ so ya bụrụ ejima nwoke abụọ, nke anọ abụrụzịa nwaanyị ọ na-achọ. Mana otu nwaanyị ahụ mechara nwụọ. Kedụ ihe mere ụfọdụ ụmụnwaanyị ji achọkarị ka hamụtarịrị nwoke maọbụ nwaanyị? N'agbanyeghị ihe ọdachi na-adakwasị ụmụnwaanyị na-agba mbọ ịmụta nwoke maọbụ nwaanyị mgbe ụfọdụ, ọtụtụ achọghị ikwụsị ya bụ atụmatụ. Ihe mere Chinenye ji ụmụnwoke atọ ji chọọ ịmụtarịrị nwa nwaaanyị Gịnị mere e ji achọkarị nwa nwoke? Chinedu Balogun kwuru na otu n'ime ha bụ oke ịcha ọkụ ụmụ ụwa na-enye di na nwunye. Ihe ndị ọzọ e ji achọ nwa nwoke gụnyere: Ngalaba European Union na United Nations a kpọrọ ""Spotlight Initiative"" na-ekwu na atụmatụ ịmụtarịrị nwa nwoke ebutela mmegide dị iche iche nye ọtụtụ ụmụnwaanyị na Naịjirịa. Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50950623 +entertainment BBC gbaara ndị Uburu Ohaozara akaebe mgbe ha riri ji ọhụrụ "Ji bụ eze nri niile di n'ụwa, dịka Ndigbo siri kwekọrịta. Ya kpatara e jiri wepụtara ya ụbochị pụrụ iche. N'obodo ụfọdụ n'Alaigbo, ụbọchị e ji eri ji ọhụrụ bụ mbido afọ ọhụrụ ha. Otu a ka ọ dị n'Uburu Adu nke dị n'okpuru ọchịchị Ohozara n'Ebonyi steeti. Emume ji ọhụrụ nwere ọtụtụ aha n'Alaigbo. Ndị Uburu n'onwe ha na-akpọ ya 'iri ji ọvụ' nke pụtara 'iri ji ọhụrụ' maọbụ 'Isu Ava'. Ndị ọzo n'akpọ ya ikeji, iri ji ọhụrụ, ịhajiọkụ, iwa ji na ọtụtụ aha ndị ọzo dị iche iche. A na-eme emume iri ji n'Alaigbo kwa afọ site n'ọgọst ruo ọnwa septemba. Oge a bụ mgbe eji egwuputa ji ọhụrụ n'ala. Ọ bụkwa ọge a ka eji akwusịlata ịgwupụta akụkụ n'ụgbọ n'Alaigbo bụrụ malite ọrụ ụgbọ ọzọ. Ejikwa mgbe dị otụ a ezurukwa ike ọrụ n'Alaigbo tụpụ amalịta ọrụ ọzọ. Onweghị onye ma ka ya bụ emụme siri bido n'Alaigbo, mana ihe anyị chọpụtara bụ na iri ji nwere ugwu pụrụ iche ndị Igbo n'akwaghere ya. Emụme na nganga sọ iri ji n'Alaigbo kariri akari nke bụ na ọtụtụ mmadụ na-esi obodo dị iche iche lọtacha obodo ị bịa mee emume iri ji. Ndị enyị, ọgọ na ikwu na ibe na-abịa sọrọ irie ma ṅụkwa. Nke ndị Uburu Ado mere mgbe ọnwa ọgọst dị mkpụrụ ụbọchị iri abụọ n'afọ a gọvanọ Dave Ụmahị na oriaku ya bịara ebe ahụ, iji gosi ka ya bụ emụme si dị mkpa. N'otu aka ahụ, ndị Igbo niile nọ n'ofesi na-emekwa emụme iri ji. N'obodo ụfọdụ n'Alaigbo ọ bụ Eze obodo maọbụ Ezemụọ na-aka mgbe eji eri ji n'ime onwa ọgọst rue septemba. Onye kọọrọ BBC ka esi mee emume iri ji nke afọ a n'ụbụrụ bụ Ojukwu Innocent Ene sịrị n'ụburu, ọ bụ onye ọgụ ava (onye na-agụ afọ) na-aka mgbe oge iri ji ohụrụ ruru. Ọ bụ naanị ndị Ọgwụnta nke dị n'ime Uburu ka ọ bụ ọrụ ha ịgụ ya bụ ava (afọ). ""Ya bụ Ezemou na-eji ohere a kele Chukwu Abịama maka uju nri akọpụtara n'afọ ahụ, ọ kachasị ji"" , dịka Ene siri kwuo. Ọ kwụkwara na ""n'Alaigbo, ji bụ eze nri. Ya kpatara ojiri bụrụ arụ mmadụ itukwu n'elu ji"" agbanyeghị ka ugwu ejina onye ahụ. Ihe ndọhachị azụ dị n'emụme a bụ na ndị ọgbaraọhụrụ na-ahụtazị ememe iri ji dịka emụme arụsi. Mana Ene kwuru na n'ezie emume iri ji enweghị ihe gbasara ya na arụsị. ""Ọ bụ emụme eji ekele Chineke maka ji ọhụrụ nakwa afọ ọhụrụ, ma ị kọtara ya ma ị gotere n'ahịa"". Ọ bụrụ na ekelecha orisaebuluwa maka onyinye a, onye ọbụla amalite iri ji. Gịnị mere ji jiri bụrụ eze nri niile n'Alaigbo? Ji bụ eze nrị nịịle maka onweghị ihe dị na ji na-alaniyi. Esi ọtụtụ ụzọ eri ji. A na-esu ya na mmanụ. A na-ete ya ete, sụkwa ya ka nri onuno. Eji ji eme ụrị n'ofe nke ga-eme ka ofe rọọ arọ. Ya mere eji echị onye kachasị akọ ji na mba echịchị pụrụ iche. N'Ụbụrụ Adọ nakwa ebe ndị ọzọ, a na-etụ onye ahụ Osuji. Onwekwara ndị na-echị onye ahụ Di ji maọbụ Ezeji. N'Ikem, onye kọtara ji gbara mkpị abụọ maọbụ ji ogene dịka ha na-akpọ ya, a na-etu onye ahụ Ezeji. Dịka Ojukwu Ene siri gụpụtara anyị, ihe ndị a bụ ụrụ iri ji baara ndị Igbo. N'abalị ụbọchị a ga-eme emume iri ji, a na-ericha ji ochie nịịle iji nabata ji ọhụrụ. Mgbe ahụ ji n'amalitekwa imebi, iji gosi na oge ya agaala. N'ụbụrụ Ado, dika na ebe ndị ọzọ, a na-eji emume dị iche iche anabata ji ọhụrụ. Ọ bụrụ na a gọcha ọfọ ya na ya sọ, nke onye Eze, ma ọ bụ Ezemụọ ga-eme, onye ọbụla amalite iri ji ọhụrụ. Onye ọbụna gọrọ ya bụ ọfọ ga eji mmanu nri erie ya bụ ji ohuru ahụ tupu ndị ọzọ amalite. Ezinaụlọ ọbụla ga-eji ihe ha nwere rie ji ọhụrụ. Ụfọdụ na eji ọkụkọ, ebe ndị ọzọ na eji ewu. Ebe aka uru nwaanyị otukwasa dị ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-45322732 +entertainment Jim Iyke and Uche Maduagwu: Ọ chọọla Jim Iyke okwu ọzọ ka otu izu gachara "Ọ dị ka ihe na-ebe ka na-ebekwa dịka Uche Maduagwu kwukwara okwu ọzọ nwereike ikpasu Jim Iyke iwe. Nke a na-abịa n'ihe erubeghi otu izuụka mmadụ abụọ a lụchara ọgụ gbasara ihe Maduagwu kwuru megide Jim Iyke. N'onyonyoo o tinyere n'akara Instagram ya, Uche Maduagwu kwuru na ya gara n'ụlọ 'cinema' ebe Jim Iyke na-egosi ejije ọhụrụ o mepụtara a na-akpọ 'Bad Comment'. O kwuru na Jim Iyke bịara n'ụlọọrụ ya kụọ ya ihe, mana ọ gaghị eme ka ọ kwụsị ihe ọ na-ekwu. Maduagwu jụrụ sị: ""Gịnị ka Jim Iyke na-eme o ji nweta otu narị nde naịra (N100 million) o jiri mee ejije 'Bad Comment'? ""EFCC ga-anwuchi Jim Iyke n'oge adịghị anya ka ọ kọwaa ihe na-enye ya ego."" ""Lee ọnọdụ akụnụba Naịjirịa nọ ugbua, ebee ka Jim Iyk siri nweta otu narị nde naịra o jiri mee ejije?"" Ihe a sị mere Jim Iyke ji tie Uche Maduagwu ihe Dịka okwu dị n'etiti Jim Iyke na ogbo ya bụ Uche Maduagwu ka na-ekpo ọkụ, lee ihe echere butere ya bụ ihe ebe a. Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na esmokwu a malitere mgbe Uche Maduagwu boro Jim Iyke ebubo ịme ọgwụ ego Lee ihe onyonyo ahụ n'uju ebe a: Maduagwu sị ""Jim Iyke bụ onye ọgwụ ego, ọ bụrụ na ọ bụghị onye ọgwụ ego. kedụ etu o si enweta ego"" ""A nụrụ m na mba Amerịka amachiela ya ịbata be ha, ọ bu maka na o gwuru ndị mmadụ wayo"" ""E jidela Hushpuppi, a ga-ejide Jim Iyke"" ka o kwuru n'ime ihe onyonyo ahụ. O nweghi osisa Jim Iyke sara Maduagwu maka ihe onyonyo ahụ ma rue ugbau o nweghi ihe ọzọ o kwuru maka ya. Onye ntaakụkọ redio bụ Ifedayo Olarinde a ma dịka 'Daddy Freeze' ekwuola na ọ bụrụ na Uche Maduagwu maara Jim Iyke ọfụma, ọ gaghị ekota ya okwu. Daddy Freeze, onye kwuru nke a n'ozi ọ gbasara n'akara Facebook ya ụbọchị Wenzde obi bụ ya pọlina pọlina na ihe Jim Iyke tiri Uche Maduagwu kwuru na Ijim Iyke bụ anụntị ma bụrụ onye iwe ọkụ. Ọ sị, ""Ọ gaara akara Uche Maduagwu mma na ọ chọrọ Buhari okwu karịa na ọ chọrọ Jim Iyke ."" ""E nwere ndị i kwesighị ị na-adanye na nsogbu ha, Jim Iyke so na ha. ""Ịkụ 'gbas-gbos' na-atọ ya ụtọ, tinyere na ọ na-ewe iwe oku."" Daddy Freeze kwuru na dịka onye na-arụ ọrụ redio na ya adanyebuola na nsogbu Jim Iyke mana Chineke zọrọ ya. ""N'ebe ihe dịka 2017-2018, a mara Jim Iyke njakịrị na redio, oge ahụ mụ ya na ezutebeghị ihu na ihu."" ""Mụ na ya were zute na 'lift' oge mụ na ya na-agakọ ụka na Muson o nweghị ụdị ekpere m ekpeghị."" Daddy Freeze kwuru na o nweghị ihe Jim Iyke mere karịa na o lere m anya, gawara onwe ya. Gị na-esere Jim Iyke na Uche Maduagwu? Onye ihe ejije Nollywood bụ Jim Iyke na ogbo ya bụ Uche Maduagwu abụrụla isi akụkọ na soshal midia dịka akụkọ banyere ha malitere wube n'ịntanet ụbọchị Tuzde. Nke a malitere dịka ihe onyonyo ebe Jim Iyke banyere Uche Maduagwu ọgụ, maka ""ebubo ọjọọ o kwuru Uche Maduagwu na-ebogharị ya na soshal midia. N'ihe onyonyo ahụ, a hụrụ ka Jim Iyke na-ajụ ndị nwe ụlọrụ Akụkọ Naija Hood, ihe mere ha jiri nye Uche ohere ịbata n'ụlọọrụ ha, n'otu aka ahụ Uche gwara ya na EFCC na-achọ ya. Jim Iyke makwuru Uche, kụọ ya dukaduka. O dobeghị anya na ya bụ onyonyo abụ ejije ma na ọ bụghị kama na abalị atọ gara aga, Uche wepụtara ozi n'Instagram yaebe ọ na-ebubo na ọ maghị ebe Jim Iyke si enweta ego o ji azụ akwa na-daara oke ọnụ ahịa. Uche Maduagwu , onye kwuru na ya ma ejike, ma na-etikwa akwa na akpụkpọụkwụ dị mma, na ya amaghị ihe mere na ọ bụ naanị ndị dịka Jim Iyke, Obi Cubana na Husphpuppi ka ndị ntaakụkọ na-ede maka ha. O wepụtakwara edemede na-ekwuo otu okwu ahụ. Mbọ BBC Igbo gbara ịmata ma ihe onyonyo ahụ ọ bụ ejije maọbụ ihe mere n'ihe amịtaghị mkpụrụ dịka mmadụ abụọ ndị ahụ asabeghị ozi anyị zigara ha na soshal midia oge anyị wepụtara akụkọ a. Onye bụ Uche Maduagwu?" https://www.bbc.com/igbo/afirika-58321608 +business Palm Kernel Oil: Ka e sị eme udeakị ụmụnwaanyị ji eme ọmụgwọ Udeakị bụ ibe ama ama n’ala Igbo. A na-etekarị ya ụmụaka amụrụ ọhụrụ na nne ha. A sị na ọ na-enyere ha aka ịgbake ọsọsọ. Ihe onyonyo a ga-egosi ka e si eme ya na ihe ọ na-arụ. https://www.bbc.com/igbo/57421666 +sports Senegal vs Algeria: Onye ga-amaburu Iko Afcon taa? Mba Senegal na Algeria ga-ezute taa n'ọgbọ egwuregwu dị n'obodo Kaịro di n'Ijipt n'asọmpi agbachaa ekuru nwa nke Africa Cup of Nations. Mgbe Algeria rutere agba ikpeazu asọmpị a bụ afọ iri abụọ n'itoolu gara aga. Amụbeghị ọtụtụ ndị sọ asọ mpị a mgbe ahụ. Mgbe ahụ bụ afọ 1990 mgbe ha na Naịjirịa zutere na be ha. Ha ji otu ọkpụ asataghị asata wee sị Naịjirịa ha were ọla ọcha kasie onwe ha obi. O ruola afọ 17 kemgbe Senegal tụrụ ụkwụ na agba ikpeazụ Afcon. Nke a bụ n'afọ 2002. Onye nkuzi ha ugbua bụ Aliou Cisse so na ndị sọrọ mpị mgbe ahụ Kameroon ji ọkpụ atọ asatara abụọ merịe ha n'agba penarịtị. Nke a bụ nzute nke abụọ Ọlgeria na Senegal na-ezute onwe ha n'asọmpị Iko Mba Afịrịka nke afọ a. Aljeria ji otu ọkpụ asataghị asata merie Senegal na nzute ahụ. Sengal agbaala asọmpị isii. N'ime ya ha meriri anọ, gbaa nhatanha otu ma gbara aka n'otu. Ha nyekwara gọọlụ asatọ Onye egwu ha ama ama bụ Sadio Mane Algeria agbaala asọmpi isii. Merie ise n'ime ha ma gbaa nhatanha n'otu. Ha enyeela goolu 12 Onye egwu ha ukwu na-atụ nkọ bụ Riyad Mahrez. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49043502 +politics Unicameral Legislature: Ọ ga aka mma ma akụchapụ ụlọomeiwu Senate? "Naịjirịa nwere ụlọomeiwu abụọ. Nke ukwu bụ 'Senate' ebe nke nta bụ 'House of Representatives'. Enwere ndị mmadụ otu narị na itoolu n'ụlọomeiwu ukwu. Ụlọomeiwu nta nwere ndị otu narị atọ na iri isii. Mana ọtụtụ ndị na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị na-eme iwu na Naịjiria buru nnkwu ibu. Ha na-ekwu na ọ ga-adị mma ma a kụchapụ otu n'ime ụlọomeiwu ahụ. N'ụbọchị Wenezde, Gọvanọ Ekiti Steeti kwuru na ọ ga-aka mma ma e wepu ụlọomeiwu sineti kpam kpam. N'okwu ya, ""Ụlọomeiwu dị mkpa bụ 'House of Reps'"". Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu ahụ bụ Rochas Okorocha. Ọ gwara BBC na mkparịtaụka na ọ ga aka mma ma ọ bụrụ naanị otu sinetọ na-anọchi anya steeti ọbụla kama atọ. Chidi Lemchi, onye ma nke ekwe na-akụ n'ihe gbasara ọchịchị gwara BBC Igbo na ya kwadoro ka e wepu ụlọomeiwu sineti. Lemchi kwuru na ndị ụlọomeiwu nta bụ ndị kacha mkpa n'ihi na ha na-anọchite anya ndị kacha nta n'okpuru ọchịchị niile. Mana o kwukwara na ego a na-akwụ ndị omeiwu kwesịrị ịgbadata. Gee ihe o kwuru n'uju ebe a: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49996786 +health Lyme Disease: Ihe ị kwesiri ịma maka ọrịa a chịnchị na-ebute "'Lyme disease' bụ ọrịa nke chịnchị ( 'tick arthropod') na-ebute nke nwere ike imetụ ụbụrụ maọbụ bute ịkpịkpa na ahụ mgbu. Ọrịa 'Lyme' bidoro iwu na soshal midia dịka otiegwu Justin Bueber gbara ama na ya bụ ọrịa ji ya. Ọ na-efe mmadụ ma ọ bụrụ na chịnchị bu ọrịa taa gị ma tanye gị nje bu ọrịa ahụ n'ahụ. ị ṅụ ọbara na-amasị chịnchị ya mere ọ na-anọkarị n'ahịhịa n'ọhịa na-eche anụ ọ ga amado ma mịa ọbara. Ọ na-anọkwa anụ ụlọ nwere anumanụ dịka nkịta, ewu, atụrụ maọbụ nwamba. Chịnchị nwekwara ike izo n'akwa,oche nakwa ụlọ adịghị ọcha. Ọrịa 'Lyme' na-akpa ike na mba Amerịka ugbua, ebe e nwere ya mbụ na mba Briten n'afọ 2019. Mana dịka Dọkịta Bayo Onajole siri kọwaa, e nwere ike ịhụ ya bụ ọrịa n'ime obodo na Naijiria. Onajole, onye bụ ọkammmụta ahụike ọha na mahadum 'Lagos University Teaching Hospital(LUTH) kọwara n'ọrịa na-adịkarị ""n'ime obodo ebe ndị mmadụ na-ewu ụlọ ata n'ihi na ọ bụ ụdị ebea ka ahụhụ na-ebu nje ọrịa na-amụba."" Dịka ngalaba na-ahụmaka mgbochi ọrịa na mba Amerịka bụ CDC siri kọwapụta na websaitị ha, ihe ndị e ji ama onye ọrịa 'lyme' ji gụnyere; Dọkịta Ọnajole kwuru na a na-eji ọgwụ 'antibiotics' ekpochapụ ọrịa 'lyme' n'ahụ onye ọ na-eme." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51053611 +politics Sanwo-Olu abụghị onye mbụ gbajọrọ ịza 'His Excellency' "'His Excellency' na 'Mr Governor' na-ewu ugbua na soshal midia n'ihi okwu Gọvanọ Legọs bụ Babajide Sanwo-Olu kwuru. Sanwo - Olu kwuru na ọ ga na-aza ""Mr Governor"" kama ""His Excellency"" iji gosi obi umeala na ijere ndị Legos ozi dịka ọ kwesiri. O kọwara na ""His Excellency"" na-eme ka onye nọ n'ọchịchị na-ebuli onwe ya karịa ọkwa ya. N'agbanyeghi ihe a o mere, ndị mmadụ si n'ụzọ di icheiche nabata ya. Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Cheta Nwanze kwuru ka Sanwo-Olu chee ihe chere ya n'ihu. ""Ihe Sanwo Olu mere bụ ihe Bekee kpọrọ ""soft sell"", ihe dị mkpa bụ ịrụ ọrụ, ọ bụghị aha"". Ndị ọzọ kwenyere n'ihe Cheta kwuru bụ Captain Obvious si ya tinye anya n'ọchịchị bụ ihe dị mkpa. N'aka nke ọzọ onye dịka Mazi Waltz na-ekwu ka gọvanọ steeti ndị ọzọ nyomie ya. Gọvanọ ndị ọzọ gbahapụrụ echichi ""Your Excellency"" - Aka chiburu Niger state n'afọ 2007 bụ Muazu Bbangida Aliyu kwuru ka a kpọọ ya ""The Chief Servant"" mgbe e duchara ya n'iyi ọrụ - N'afọ 2015, aka chiburu Oyo steeti bụ Abiola Ajimobi kwuru ka akpọọ ya ""Abiola Ajimobi"" sọsọ. - Ebe ọgbọ ya bụ Rauf Aregbesola kwuru ka a kpọọ ndị Gọvanọ ""Mr Governor"" kama His Excellency." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50313834 +business Innoson VS Gtbank : Ihe mere Innoson ji chọọ iweghara GTBank maka ụgwọ ụlọakụ ahụ ji ha "Dịka akụkọ na-efegharị na Innocent Chukwuma, onye nwe ụlọọrụ 'Innoson Group', nwereike iweghara Gtbank ma ọ bụrụ na ụlọakụ ahụ akwụghị Innoson ụgwọ ha ji ya, ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Innoson Group bụ Cornelius Osigwe akọwala ihe ya bụ okwu pụtara. Onye nwe ụlọọrụ Innoson bụ Innocent Chukwuma kwuru na nsonso a na ọ bụrụ na ụlọakụ 'Gtbank' akwụghị ụlọọrụ ya ijeri naira iri atọ na abụọ (N32bn) nke ụlọikpe kpebiri ka ha kwụọ ya, na ya ga-eweghara ụlọakụ ahụ ma isiego na ọmụrụnwa so ya karịa ego ụlọakụ ahụ nwere. Chukwuma, kwuru nke a na nsonso a, oge ọ na-aza ndị ntaakụkọ gara n'ụlọọrụ ya dị na Nnewi, Anambara steeti ajụjụ. O kwuru na ya na bụbu ezigbote onyeahịa ụlọakụ GtBank oge Tayo Aderinokun bụ onyeisi ụlọakụ ahụ larala mụọ nọ nke mere ka ụlọakụ ahụ rụọ ngalaba ụlọakụ ha na Nnewi. Mana na egwu dagharịrị oge onye ọhụrụ nọchiri ya. Na nkọwa ya, Osigwe gwara BBC Igbo n'ekwentị na ""akụkọ ụnụ na-anụ bụ eziokwu."" ""Anyị ma na enwetala mkpebi n'Ụlọikpe Kachasị bụ ndị gwara Gtbank ka ha kwụọ anyị ego ha were n'akpaego anyị dị n'ụlọakụ ha."" ""Oge e nyere mkpebi mbụ n'Ụlọikpe Ukwu nke Etiti, ihe e kpebiri ha ga-akwụ anyị bụ N4.7bn."" ""Ụlọikpe kwuru na ego ahụ ga-eji pasent 22 na-erite ọmụrụnwa were ruo oge ha ga-akwụ ya bụ ụgwọ."" ""Ọ bụ ihe ndị a ka anyị gbakọrọ malite na Ụlọikpe Ukwu ruo Ụlọikpe Kachasị"" o were rute ijeri naira 32. Ọ gara n'ihu bo ebubo na kama imezu ihe ụlọikpe gwara ha, na ụlọakụ GTbank ahụ na-agbagharị akwụkwọ n'Ụlọikpe kachasị ka ha lebagharịa anya n amkpebi ha nyeburu. Ọ sịrị, ""Ha agbabuola akwụkwọ n'Ụlọikpe Kachasị, a kụpụ ya, mana o nwere akwụkwọ ọhụrụ ha gbara n'Ụlọikpe Kachasị."" N'ajụjụ ma Innoson ọ ga-enwe ike imezu nke a ebe ọ bụ na Gtbank ahazighariala ụlọọrụ ha ma gbanwee aha ha ka ọ bụrụ, GTco, Osigwe sara sị, ""Aha ọ bụla ọ masịrị ha na-aza, mkpata na mmefu ha nille ka ga-abụ nke GTBank."" Mbọ BBC gbara inweta olu ụlọakụ GTbank amịtaghị mkpụrụ. Onye na-arụrụ ụlọakụ ahụ ọrụ na-achọghị ka a kpọ aha ya kwuru na ""Ụlọakụ ahụ achọghị ka ha na onye bụbu onye ahịa ha na-eme tụmsara."" Cheta na Innoson na GTbank anọọla n'ụlọikpe ọtụtụ afọ maka ikpe metụtara ebubo na ụlọakụ ahụ zupuru nde kwuru nde Naira n'akpaego Ịnnoson nwere n'ụlọakụ ahụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59334378 +health Prostate Health: Etu ị ga-eme ka 'prostrate' gị na-achị sọ ọchị "Otu ọrịa na-amapụ ụmụnwoke obi bụ Kansa na-eme agede bụ mkpụrụ dị n'ime ahu nwoke Bekee na-akpọ ""prostate"". Agede bụ mkpụrụ di n'etiti amụ na akpa mamịrị. Akwara si akpa mamịrị gafere n'ime ya. Ọrụ agede, dịka ndị ọkammụta sayensị siri dee bụ imepụta mmiri na-enye miri utu aka. Ọ na-abụ nwoke nyụọ mmiri utu, agede agbanye ya mmiri nke a. Ya bu ọrụ ya dị mkpa n'usoro ịmụ nwa. Prostatitis: Agede na-eko oge ụfọdụ. a na-akpọ ya ""Prostatitis"" na Bekee. O nwere ike ịbụ nje na-ebute ọnọdụ a. Ọ bụ ọgwu a kpọrọ ""antibiotics"" ka a na-eji agwo ya. Prostate Hypertrophy: Agege tofere oke na-emekwa oge ụfọdụ. Bekee na-akpọ ya ""prostate hypertrophy"" maọbụ BPH. Ihe na-eme ụmụnwoke niile gafere afọ 50. Ọ na-eme ka ịṅyụ mamịri na-arịa ahụ. E ji ọgwụ na ịwa ahụ agwọ ya. Prostate Cancer: Kansa Agede bụ ụdịrị kansa na-emekarị ụmụnwoke mana sọsọ otu n'ime ụmụnwoke 41 na-anwụ site na ya. Ịwa ahụ, iji ọgwụ gbuo izi (nke Bekee na-akpọ ""chemoteraphy"") na usoro Bekee kpọrọ radiation agwọ kansa agede. 1: Gaa mee nyocha N'ọnwa janụwarị 2020, BBC dere na ọ bụ kansa agede bụ nke a kachasị ahụ n'ahụ mmadụ n'obodo Eliza. Mana ngalaba a kpọrọ ""Public Health England"" kwuru na ihe kpatara nke a bụ makana ọtụtụ ụmụnwoke na-agazi ime nyocha. Dịka anyị kwuru mbụ, otu ihe dị mkpa ime bu iga mee nyocha mata ma ha e bu kansa agede. 2: Rie ezigbote nri Ọtụtụ mmadụ amaghị mkpa nri dị, ọkachasị nri nwere ihe niile e kwesiri inwe maka inye ndụ ahụ. Ndị ọkachamara na-ekwu na tomato, agwa, azụ na ndi ọzọ na-adị mma maka ahụike agede. Ya bụ, rie nri nwere ihe Bekee na-akpọ ""balanced diet"". Agbanyeghị ihe ndị a edepụtara, dọkịta Bekee aha ya bụ Mcginger Ibeneme gwara BBC na o nwechaghi ihe e ji egbochi ya karịrị ime nyocha n'oge. Dọkịta Ibeneme sịkwa na o nwere ndị dọkịta na-asị na nwoke na-eme mmekọrịta nwoke na nwaanyi kwa mgbe anaghị enwetakarị nsogbu agede, mana ọ sị na ọtụtụ ndi dọkịta ekwebeghi na nke ahu bụ eziokwu." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51831431 +business Saudi Arabia attacks: Nigeria ga-erite uru na mbuli ọnụego mmanụ agbịdị Ala adịghị mma bụ uru ndị nze ka ọ dị ugbua n'okwu banyere mmanụ agbịdị na mbaụwa niile. Ọnụego mmanụ agbịdị arịala elu nke kachasị ibe n'ime ọnwa anọ n'ihi ogbunigwe a gbara n'ụlọọrụ mmanụ agbidi mba Saụdi Arebia n'ụbọchị Satọde. Dịka ọ dị ugbua, Saụdi Arebia akọwabeghị nke ọma etu mwakpo a si mee mana ha kwuru na onweghi onye merụrụ ahụ. Kedụ etu ọ ga-esi metụta Naịjirịa? Ndị ọkachamara n'okwu akụnaụba na Naịjirịa kwuru na nke a bụ ezi ihe nye Naịjirịa na akụnaụba ya dịka mmanụ agbịdị bụ ụzọ kachasị ha si enwete ego. Ugo Obi-Chukwu kwuru na nke a ga-emetụta Naịjirịa n'ụzọ dị mma dịka ha ga-etinyekwu ego n'ọnụ mmanụ ha, nke bụ dọla iri isii kwa otu ite mmanụ ugbua O kwuru na ọzọ bụ Naịjirịa ga-enwe ohere ire ite mmanụ agbịdị karịa ite ole ha na-ere ugbua nke bụ nde abụọ kwa ụbọchị. Onye ọzọ bụ Chinwe Egwim sị na ihe a mere na Saụdi Arebia nwereike ime ka onụego ite mmanụ rue otu narị dọla ($100/barrel) nke bụ ihe ọma nye Naịjirịa. N'otu aka ahụ ọkanmụta Boniface Chizea sị na Naịjirịa kwesiri iji ohere a rite ezigbo uru tupu ọnụego mmanụ adaa maka na mbuli a agaghị anọte aka. Ugo Obi-Chukwu sị na dịka ọ dị ugbua ọ na-ara Naịjirịa ahụ ịmịpụta mmanụ agbịdị etu ha kwesiri kwa ụbọchị ka ọfọdụzie ịmịpụta karịa. Ọzọ bụ na ọnụ ego Naịjirịa na-eji ebubata mmanụ ga-arị elu nke nwereike ibuli ọnụego mmanụ ụgbọala na Naịjirịa. Ọ gara n'ihu kwuo na Naịjirịa ga-eri nnukwu uru ma ọ bụrụ na ha nwee ike welite aka n'ite mmanụ ole ha na-ere kwa ụbọchị. Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-49713270 +entertainment Davido New baby: Nwaanyị ọ chọrọ ịlụ amụọlara ya nwa 'agbaagba' nwa nwoke "Ure nwa ooooo! Davido etiwasala akụkọ ahụ ụmụ ụwa na-eche kamgbe. Cheta na oti egwu ama ama dịka Davido(David Adedeji Adeleke) depụtara ọsịsa o nyere onye na-ajụ ya maka egwu ọ ka na-etipute etipute, ndị mmadụ buru okwu ahụ gawa ""ụlọakụ"". Ọtụtụ ụmụ Naịjiria bidoro kelewe Davido makana ha chere na ọ bụ ọmụmụ nwa Chioma(onye ọ chọrọ ịlụ). Mana n'oge na-adịghị anya, Davido depụtara na David nke obere awụchiela ma tokwa nwunye ya bụ Chioma, na-ekwu na o siri ike. @_omoissy kwuru na ọ nọ na-eche akụkọ ọma kamgbe elekere iri na otu nke abalị fotere taa. @Amchizzy kelekwara ya. @Real_jaeflex na-ekpere ha ekpere ọma. @@PluckyPrecious kelere Davido maka etu o si kele nwunye ya." https://www.bbc.com/igbo/media-50114920 +health Coronavirus Myths: I nwereike ibute coronavirus site na ahụrụ? "Dịka ọria coronavirus na-akpa ike na-aga n'ihu na Naijiria na mbaụwa, kepukepu ọhụrụ na-efegharị ugbua bụ na e nwere ike ibute ọria ọjọọ a site n'ahụrụ. Mana ndị ọkachamara ahụike gwara BBC lgbo na mkpụrụ adịghị n'ụkwa a ndị na-efesa ya bụ akụkọ na-apị. Kemgbe ọrịa coronavirus pụtara mbụ na Chaịna n'afọ 2019 ruo ugbua, ọria a nke ndị ọkachamara kwuru na a na-ebute site n'ụkwara maọbụ uzere, ataala isi otu ijeri mmadụ na ụma n'ụwa nile. Aka nile dị n'ọbọ ime nchọpụta maka ya bụ ọrịa, ọkachasị ọgwụ mgbochi na ọgwụgwọ nakwa etu ọrịa si ekesa. Otu ndọrịtaụka ọhụrụ pụtara n'ịntanetị bụ nkwenye ụfọdụ na mmadụ nwere ike ikuru coronavirus n'ahụrụ onye bu ọrịa a nyụrụ ọkachasị onye eyighị ọbante. Ọkachamara n'ihe gbasara nje nke Bekee kpọrọ 'virologist' bụ Ọkammụta Oyemade Tomori sị na, ""onye na-ekwu ụdị okwu a na-ama njakịrị."" O kwuru na ""e nwere ike ịhụ nje a na ngụgụ nakwa akụkụ ndị ọzọ e ji eku ume."" Dọkịta ahụike ọha na 'Lagos University Teaching Hospital' (LUTH), Dkta Bayo Onajole nakwa odeakwụkwọ otu jikọrọ ndị sayentist (Nigeria Academy of Science) bụ Dkta Doyin Odubanjo tinyekwara ọnụ n'ihe Tomori kwuru. Onajole sị na, ""ọ bụghị eziokwu"", ebe Odubanjo si na""anụbeghị m ya mbụ"". Mana Odubanjo na Tomori kwuru na nchọpụta gosiri na nje coronavirus nwere ike ịdị na nsị onye bu ya. Tomori, onye bubu onyeisi NASS sị, ""N'ezie, e nwere ike ịhụ ya na nsị."" N'otu aka ahụ, Dkta Odubanjo si, ""nchọpụta na-ekwu na-enwere ike ibute ya na nsị onye bu nje ahụ ọbụladị ma nnyocha kwuo na ọ gbakela"". ""Ya mere o ji dị mkpa ịkwọ aka ọfụma ma ị gachaa ụlọmposi."" Mana Onajole ekwetaghị na e nwere ike ibute nje coronavirus na nsi. O kwuru na coronavirus bụ ""ọrịa ọwa e si eku ume, (gastro-intestinal tract), ọ bụghị ọrịa nsi nke bụ nsi na nsị na ọnụ (fecal-oral)""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52286924 +health Health and Wellness: Ihe ise ịgbaọtọ rahụ ụra ga-emere ahụ gị "Irahụ ụra bụ otu ihe onye ọbụla na-emekarị n'abalị, nke bụ na ụwa dum nwere nkwekọrịta na irahụ ezigbo ụra na-edozi ahụ. Ndị dọkịta apụtabeghị kwuo na e nwere nchọpụta gosiri na iyi akwa rahụ ụra dị mma karịa igba ọtọ. Mana ndị nkuzi maka ọdịmma ahụ na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha yipụ akwa rahụ ụra. Kris Ero bụ udiri onye nkuzi a gwara BBC ihe mere o ji dị mma mmadụ iyipụ akwa ma ọ chọo ịrahụ ụra. 1. Ọ na-eme ka okpofufu ghara inye gị nsogbu ma ị na-arahụ ụra Ero kwuru na igba ọtọ rahụ ụra ga-eme ka ahụ gị jụọ oyi . Nke a ga-eme ka ị rahụ ụra ọfụma. 2. Ahụ na-egbuke egbuke Maka na igba ọtọ rahụ ụra na-eme ka mmadụ rahụ ụra ọfụma, ọ na-eme ka ahụ maa mma. Otu nyocha e mere maka ịchọpụta ma arahụghị ụra a na-egbchi ohere ọnya mmadụ ịla ọsịsọ gosiri na inweta ezigbo ụra na-enye aka. Ero kwuru na ọ na bụ ha na-agwa ndị bịara ikpesa na ha anaghị arahụ ụra ọfụma, ihe mbụ ha na-ajụ bụ ""akwa ole ka ị na-eyi n'ahụ were alakpu ụra?"" O kwuru na ha na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha na-agba ọtọ arahụ ụra ka ahụ dere ha duu ma mekwaa ka obi ha ruo ala. I teta n'ụra, ahụ agbasie gị ike. Ero kwuru na igba ọtọ rahụ ụra ga-eme ka ahụ gị na onye nke gị (dị maọbụ nwunye gị) na-emetụta. Nke a ge-eme ka nsori na-atọ ụtọ maka na ahụ ụnụ ga-anabata nsori ọsịsọ. Ero kwuru na igba ọtọ rahụ ụra ga-eme ka onwe gị maọbụ ahụ ju gị afọ. N'okwu ya, onweghị ihe ịgwara onye na-agba ọtọ arahụ ụra ga-akụja ya. O kwuru na ọ ga-adị mma ka ndị na-ahụghị ahụ n'anya na-agba ọtọ arahụ ụra. ""I na-ekpuchi ahụ gị site n'ụtụtụ ruo abalị, n'abalị yipu akwa gị niile ka ahụ gị kute ume." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51765253 +sports Ruth Okafor :Mmegbu kpatara m ji bido igbu pịpịrọ n'asọmpị bọọlụ Nwaada Ruth Nwadinma Okafor na-egbu pịpịrọ n'asọmpi bọọlụ kọwara etu njem ya si malite n'igbu bọọlụ. Ọ sị na o bu ụzọ malite ịgba bọọlụ mana mecha banye n'igbu egbu n'ihi etu otu onye ogbu bọọlụ si gbujọọ asọmpi nke mere ka e merie ha. Okafor sị na o ji we ahụ na mwute ga mụọ etu e si egbu pịpịrọ na bọọlụ bụ 'referee' na Bekee. Ọ kọwakwara etu o si nwete ọzụzụ ịzọ ndụ ndị ọgba bọọlụ dara n'ọgbọegwuregwu bọọlụ nakwa ụfọdụ n'ime ọ zọrọ ndụ. Okafor nyere ndụmọdụ ka onye ọbụla gbalịa chọpụta akaraka ya ma soro ya na-eleghi anya n'azụ. Kirie ihe o kwuru n'uju; https://www.bbc.com/igbo/afirika-53385045 +business African Eye: Nwoke Chaịna na-akpa ego site n'ime ụmụaka Afrịka akaja E nwere mgbere ihe onyonyo na-ewu n'ụfọdụ ebe n'ụwa ọkachasị na mba Chaịna. Ọtụtụ ya bụ ihe onyonyo na-egosikarị ụmụaka eji ezi ozi mgbe ndị mmadụ na-eme emume pụrụiche dịka ụbọchị ncheta ọmụmụ ha. A na-ere ihe onynyo ndị a ihe dịka dọla iri asaa. Kama enwere nke kpaliri iwe ndị mmadụ mgbe ihe onyonyo gosiri ụmụaka na-ekwu na ha bụ ajọ anụ dị ojii ma kwuo na ha enweghị ọgụgụ isi. Nke a mere ka BBC African Eye zọpụ njem iji mata ndị na-eme ihe onyonyo a na ihe ha bu n'obi were eme ya. Akụkọ a bụ maka ihe ha chọpụtara. https://www.bbc.com/igbo/articles/cg39vwzp70zo +politics Ipob one month sit at home: Ihe Ohaneze, Igbo Ekunie na ndị Igbo ọzọ nwere ikwu maka ya Ihe onyonyo a na-egosi ihe ndị Igbo nwere ikwu maka etu Indigenous People of Biafra (Ipob) si ekwuputa maka ịnọ n'ụlọ ruo otu ọnwa ma ọ bụrụ na gọọmentị etiti akpọtaghị Nnamdi Kanu bịa n'ụlọikpe n'Ọktoba 21. Ndị ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ OhanezendịIgbo, Igbo Ekunie na ndị Igbo nkịtị ekwupụtala uche ha maka iwu ndị Ipob nyere gọọmenti etiti. N'ozi ha bipụtara, ndị Ohaneze sị na ha echeghị na ọ bụị Ipob nke Nnamdi Kanu hibere kwupụtara nke a. Ha sị na ha Ipob nke Nnamdi Kanu hibere bụ ọdịnamma ndị Igbo n'obi nke ukwuu. Otu ọzọ kpọrọ onwe ha Igbo Ekunie kwụ n'ihu mgbe mbụ anwuchịrị Nnamdi kanu n'afọ 2015 dere n'akwụkwọ ozi ha nke onyeisi ha bụ Ichie Chigbo Uzokwelu binyere aka depụtara si ka ndị Ipob kpachapụkwa ụdị uche a. N'aka ọzọ, ha gwara ndị gọọmenti etiti ka ha gba mbọ hụ na ikpe Nnamdi Kanu gara ọfụma. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58670543 +politics APC: Fayose a na-akwa ha emo maka ihe Oshiomhole kwuru n'Imo? "Akụkọ dị mkpa: Fayose a na-akwa APC emo? Aka chịburu Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose, etinyela ọnụ n'okwu Adams Oshiomhole bụ onyeisioche otu APC, kwuru maka onye Onyeisiala Buhari na-akwado na ntuliaka Imo steeti. Fayose kwuru sị ""mgbe onyeisioche pati kwuru na onyeisioche ndị gọvanọ nọ n'okpuru pati ya achịtaghị aja, ekwesịghị ịgwa gị na pati ahụ nakwa gọọmentị ya adaala. Achịtaghị aja n'imo pụtara achịtaghị aja n'Abụja"". EFCC asaala Union Bank N'agbanyeghi ihe ụlọakụ Union Bank sara na Twitter ebe ha kwuru na ọ tụrụ ha n'anya na EFCC wepụtara okwu gbasara ego a hụrụ n'ọdọụgbọelu n'Enugwu tupu ha emecha chọpụta, EFCC kwuru na ha ka ga-eme nyocha ọfụma iji mata nke bụ eziokwu. EFCC gwara BBC na ha ka ji ndị ha nwụchiri maka ego ahụ ruru nde abụọ na puku asatọ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Anyị ka ji ndị anyị natara nde $2.8 n'Enugu - EFCC Na mba ofesi, Awil Dihar Salad so n'ime ndị ntaakụkọ a na-anụ aha ha na mba Somalịa, so na ndị nwụrụ ka ogbunigwe e tinyere n'ụgbọala dị nso ebe onyeisiala mba ahụ bi n'obodo Mogadishu, gbapụrụ. Ihe ruru mmadụ iri na asaa merụkwara ahụ na mwakpo a nke ndị oyiegwu Al-Shabab kwenyere na aka ha dị na ya. N'egwuregwu, Arsenal agbarala isi onwe ha site n'ígba Burnley ọkpụ atọ asatara otu na Premier League n'izu a. Cheta na onye ọbụla kpụ ha n'ọnụ ka Southampton na Liverpool nyeruchara ha goolu atọ atọ oge ha zutere n'izu gara aga. Gere akụkọ BBC na nkeji ebe a: Ndị uweojii n'Imo steeti anwụchiela mmadụ atọ ha sị na-eyi uwe ndịagha were atọrị mmadụ Ndị ngalaba Federal Special Anti-Robbery Squad (F-SARS) sị na ndị a tọrọ di na nwunyee si Amerịka lọta maka emume ekeresimesi. Dasuki Galadanchi bụ onyeisi ndi uweoji n'Imo sị na ndị a nọ na-akwọrị dọla ha natala ndị a ha tọrọ mgbe aka ndị uweojii kpara ha. Buhari kwụ Uzodinma n'azụ -Oshiomhole Onyeisi oche All Progressives Congress (APC) Adams Oshiomhole ekwuola na ọ bụ Hope Uzodinma ka Onyeisiala Muhammadu Buhari na-akwado na ndọrọndọro oche gọvano n'Imo. Oshiomhole kwuru nke a ka ọ nọ ebe a na-eme emume mmalite achụmta vootu APC n'Owere. Cheta na Oshiomhole na Okorocha bidoro ịtụ onwe ha okwu kemgbe emechara ntulịaka imeụlọ nke APC n'Imo, bụ nke ọgọ Okorocha bụ Uche Nwosu so n'ime ndị atunyere vootu. Ụlọ gọọmentị n'Amerịka agbachiela Ụlọ ọrụ gọọmentị dị iche iche na mba Amerịka agbachiela ka Onyeisiala Donlad Trump na ndị Omeiwu enweteghị nkwekọrịta maka ego mgbidi ọ chọrọ ka agba n'oke Amerịka na mba Mexico. Nke a bu ugboro atọ ụlọ ọrụ gọọmenti gbachiri n'Amerịka n'afọ a. Nke a na-abịa ka ụlọikpe nke ukwu n'Amerịka kagbụrụ mmachị Trump tinyere igbochi ndị gbatara ọsọ ndụ itinye akwụkwọ ga-enyere ha aka nwete ikike ịnọ n'Amerịka. N'egwuregwu Mohammed Salah dị ọkụ n'asọmpị nke Liverpool na Wolves gbara ụnyaahụ ka onyere goolu otu ma nyekwa aka nwete ọzọ ka ha ji okpụ gọọlụ abụọ asataghi merie. Anya ga-adị na Alex Iwobi ka Arsenal na Burnley ga-ezute n'ime otu asọmpị a ga-agba taa. Gee nkeji ndi ebe a: Lee ihe nkiri nke taa: Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-46657935 +sports Southampton vs Man United: Akpịrị mmeri ka na-akpọ Man Utd nkụ Ọ fọrọ obere ihe ka ndị Manchester United gbara aka pọintị taa, dịka ndị Southampton na-ele ha ọbịa chasiri ha ọkụ ike. Goolu Daniel James nyere na nkeji 10 e ji bido bọọlụ ezughi inye ha mmeri na-agụsi ha ike kemgbe Crystal Palace gwọrọ ha ara n'izu gara aga. Goolu a mere ya nke atọ James nyerela n'ime egwuregwu anọ ọ na-agbara Man Utd kemgbe ha zụtara ya. Jannik Vestergaard nke Southampton ji isi tawarie neetị David de Gea na nkeji 58, iji gosi Man Utd na ha akpọtaghị ha n'ụlọ ha ịgba ha nkiri. Goolu ahụ bụkwa nke mbụ Vestergaard na-enye kemgbe ọ gbawara n'Ịngland. N'agbanyeghi na e mechara chụpụ Kevin Danso nke Southampton na nkeji 73, Man Utd anyụghị anwụ nke ha ji agbọ ụja. Ka ọ dị ugbua, Man Utd enwetala pọintị ise n'ime 12, nke mere ka ha nọrọ n'ogogo anọ na tebulu Premier League. Ebe Southampton nwere pọịntị anọ. Man Utd ga-ezute Leicester City bụ ebe nwaafọ Naịjirịa bụ Wilfred Ndidi na-agba, ụbọchị 14 nke ọnwa Septemba. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49537080 +health Nwoke ndị NDLEA nwuchiri nyụrụ ngwugwu ọgwụike 95 Ngalaba Gọọmentị Naijirịa na-aluso ọgwụike ọgụ bụ Ndlea n'aha ịchafụ ekwuola na ha anwụchiela otu nwoke aha ya bụ Nwakanma Uche n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe nke dị n'Abuja maka mgbere ọgwụ ike. Nwakanma dị afọ 36 nyụpụtara ngwugwu ọgwuike iri itolu na ise ọ chọrọ iji banye ụgbọleu na-aga mba Fransị. O kwuru na ọ lọtara ịlụ nwaanyị ma sị na ọ bụ otu nde Naira na ụma ka a ga-akwụ ya ma ọgbachaa mgbere ọgwụ ahụ. N'Akwa Ibom ka ndị Ndlea kwukwara na ha nwuchiri otu nwaanyị bụ Irene Emmanuel Bassey n'ụbọchị Satọde dịka ahụrụ Igbo ruru 30.5kg n'ụlọ ya dị n'obodo Ikpa, na okpuru ọchịchị Esit Eket. Ngalaba na-aluso ọrịa ọgụ na Naijirịa bụ Ncdc n'ịchafụ ekwuola na ha ahụla ọrịa monkeypox n'ahụ mmadụ iri abụọ na otu na Naijirịa. Ọ bụ onyeisi otu a bụ Ifedayo Adetifw kwuru na ọ bụ n'ime steeti itoolu ka ha hụrụ ọrịa ndị a nke gụnyere Abuja - 5 , Adamawa - 5, Legọs - 4, Bayelsa - 2, Delta - 2, Krọs Rịva - 1, Kano - 2, Imo - 1 na Rịvas Steeti - 1. Ha depụtara na Websaịt ha na otu onye dị afọ iri anọ nwụrụla maka ya bụ ọrịa. Ahụla ozu mmadụ14 so ụgbọelu dara a na-acho achọ na mba Nepal A hụla ozu mmadụ iri anọ n'ime mmadụ iri abụọ na abụọ dịka ụgbọelu bu mmadụ iri abụọ na abụọ dara n'ụbọchị ụka na mpaghara Mustang na mba Nepal. Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha mba Nepal kwuru na ha ka na-achọ ma e nwere ndị ka dị ndụ kama ọnọdụ mbara eluigwe na ugwu nọ n'ebe ahụ na-echere ha aka mgba. Ndị nọ n'ime ụgbọelu a gụnyere mmadụ anọ si mba India, abụọ ndị mba Jamanị na mmadụ iri na isii bụ ndị mba Nepal. Ndị ọrụ gbatagbata ka na-achọ ndị ọzọ so ya bụ ụgboleu mgbe ọ dara. https://www.bbc.com/igbo/afirika-61630752 +health Health tips: Lee ihe maamịrị gị na-agwa gị maka ahụike gị "Ịhe ịgbachị maamịrị nwereike ibutere gị. Amịrị maọbụ maamịrị bụ mmiri a na-anyụpụta n'ahụ mmadụ na-ebu ihe ụfọdụ ahụ mmadụ achọghịzị. Maamịrị nkịtị nwere mmiri, urea, nnu, nakwa ihe nyere ya agwa ọ tụrụ Bekee kpọrọ ""pigments"". Ihe ndị ọzọ nwekwara ike ịnọ na maamịrị bụ nke Bekee kpọrọ kolrin, potashium, nnu, sayensi kpọrọ sodium, kritinine (creatinine) ayọn (iron) nakwa ihe ndị ọzọ. Mmiri dị na maamịrị dị pasent iri itoolu na ise (95%). Ihe ndị ọzọ niile a bụzị pasentị ise (5%). Maamịrị nwekwara ihe Bekee kpọrọ 'Urea' nke nwere 'amonia' nke enweghị ike ịmerụ mmadụ ahụ, ya na 'kabọn dayọxaịd"". Mgbe ụfọdụ, ọbara nwekwaraike ịdị n'amịrị bụ nke Bekee kpọrọ ""proteinuria"". Ndị a gosikwara ọrịa imeahụ. Ihe ise eji mara amiri bụ agwa ọ tụrụ (ya bụ ụcha ya), isi, ọrụrọ ya, pH ya (asid maọbụ akalaịn dị ya) nakwa arọ ọ dị mgbe iji mmiri tụnyere ya. Christopher Ọzoanị Ugwu bụ dọkịnta Bekee na-ahụ maka nje n'ụlọọgwụ na Parklane Enugu sị na ịkpachị maamịrị adịghị mma. Ọ sị na ""o nwereike imebetere akịrị (kidney) mmadụ ọgbatauhie"". Ọ sị na ọ dị mkpa na onye ọbụla maamịrị kpawara gara nyụọ ya ozugbo maka ịkpachị ya nwereike imeru onye ahụ ahụ. Gịnị ka ịkpachị maamịrị nwereike ibutere mmadụ? Dọkịnta Chris Ozoani Ugwu sị na ịkpachị amịrị nwereike ibutere mmadụ ahụụfụ na ọrịa mbute. Ndị ọkachamara na Healthline sị na ịkpachị amịrị otu mgbe maọbụ ugboro ole maọbụ ole agaghị eme mmadụ ihe ọbụla ka na ọ nwereike ịme ihe ma ọnye ahụ merezia ya gawa n'ihu. Ha kwuru na ""ịkpachi amịrị ihe dịka awa isii mmadụ na-eme njem nwereike ọgaghị eme ya ihe ozigbo, mana ọbụrụ na onye ahụ kparazịa ya gawa mpiti nwereike ịkwe onye ahụ n'ime ahụ"". Lee ihe ụfọdụ ha sị na ịkpachi maamịrị nwereike ime mmadu: •Onye kpachịrị amịrị ogologo oge nwereike ịbute ọrịa mbute Bekee kpọrọ ""urinary tract infection (UTI)"". •Ọ bụrụ na ị na-akpachị amịrị gị na-enweghị nkwanye ugwu, akpaamịrị gị na akwara ndị ji ya nwereike ịda mba nke bụ na amịrị nwereike ị na-aba onye ahụ kwa mgbe kwa mgbe. •Ọ bụrụ na-ịkpachie amịrị karịa awa iri, akpa amịrị onye ahụ nwekawaraike ịkpọchi nke bụ na ọgaghịzị adị nfe onye ahụ ịnyụ amịrị mgbe ọ chọrọ. •Ịkpachị amịrị nwekwaraike ime ka akpaamịrị mmadụ gbawa, mana nke a na-ahịa ahụ. Ịkpachị maamịrị o nwereike igbu mmadụ? Ndị ọkachamara ọrụ ahụike sị na nke a enweghị ike ime, kama ọbụrụ na onye ahụ kpakarịa amịrị, akpaamịrị ya nwereike ịgbawa. Nke ahụ nwereike ibutere onye ahụ ọnwụ. Agwa (ụcha maamịrị) Mgbe maamịrị gị na-acha mmiri miri ihe o gosiri bụ na ị na-aṅụ oke mmiri karịa ka ị kwesiri. Ụfọdụ ihe na-ewụ bụ ka ndị mmadụ na-aṅụ mmịrị mgbe dum, mana nke a egosila na mmiri nwereike ịkarị n'ahụ mmadụ, dịka ndị ọkachamara si kwuo. Ha sị na oke mmiri nwereike igbari ""electrolytes"" dị na ahụ mmadụ. ""Electrolytes"" bụ mịnaralụ dịka ""sodium"", ""potashiụm"", ""klorin"" na ""bikanoneti"" bụ ihe na-eme ka akwara nakwa mọzụl mmadụ na-arụ ọrụ nke ọma ma na-enyekwaaka na ịhụ na asịdi na bezi dị n'ahụ onye ahụ ha. Mana onye amịrị ya na-acha otu a, akụjala maka na mmekwa ya bụ ịwelata aka na mmiri onye ahụ na-anụ. Mgbe ụfọdụ amịrị mmadụ na-acha nwaobere odo odo. Mmụta sị na ọ bụ otu a ka amịrị onye ahụ dị kwesiri ị na-acha. Odo ahụ ga na apụ ma onye ahụ na-aṅụ mmịrị mgbe ọbụla. Ihe na-ebute agwa a n'amịrị bụ mgbe ahụ mmadụ 'hemoglobin' bụ protin na-ebụ ikukundụ Bekee kpọrọ 'oxygen' dị n'ime ọbara. Ụcha maamịrị gị gosiri ka ya bụ protin a si gbaridewe. Mana ịnụkwa mkpụrụ ọgwụ vitamin B na-achakwa amịrị mmadụ odo odo. I ga-egbu ụdịrị ichi a egburu mgbe gboo? Maamịrị gị nwereike ịcha uhie uhie ma ọ bụrụ na i riri ihe na-acha otu ahụ. E nwere ọtụtụ mkpụrụ osisi na-acha uhie uhie dịka 'blueberries', na ndị otu ya. E nwekwara ọrịa na-eme ka amịrị mmadụ na-acha uhie uhie dịka mgbe 'prostate' onye ahụ zara aza, mgbe onye ahụ nwere akị n'akụrụ Bekee kpọrọ Kidney stone maọbụ mgbe onye ahụ nwere akpụ n'ime akpa akịrị maọbụ akpaamịrị. Ịhụ ụdị ihe ahụ n'amịrị gị were ọsọ were iji ga hụ ndị ọrụ ahụike gị. Mgbe amịrị gị na-acha oroma oroma, o nwereike ịbụ maka ụkọ mmiri n'ahụ gị. Mgbe ụfọdụ ọ na-acha ka nsị agbarịnyere na ya. Nke ahụ nwereike ịbu maka na onunuilu gị bara n'ime ọbara nke gosiri na imeju onye ahụ maọbụ akpa onunuilu ya nwere nsogbu. Onye nwekawara ọrịa imeju Bekee kpọrọ jaundice ga-anyụkwa amịrị na-acha oroma oroma. Amịrị mmadụ ịcha anụnụ anụnụ gosiri na onye ahụ riri ihe na-acha otu ahụ maọbụ na ihe iji eji mee onye ahụ ule na akụrụ ya maọbụ n'akpa amịrị gosiri na amịrị ya. N'ezie a ọ nwekwara nje Bekee kpọrọ pseudomonas aeruginosa na-eme ka amịrị mmadụ chaa anụnụ, mana ọtụtụ mgbe o na-esite n'ihe mmadụ riri. Ọtụtụ mgbe amịrị mmadụ chawa ụrọ ụrọ nke ahụ gosiri na mmiri kọrọ onye ahụ n'ahụ. Mgbe ụfọdụ ọ na-egosikwa onye ṅụrụ ọgwụ dịka Flagyl maọbụ chloroquine. Nrị dị iche iche nwekwara ike igosi n'amịrị mmadụ. Ọ na-egosikwa onye nwere ọrịa imeju maọbụ oninuilu. Maamịrị kochiri ekochi na-egosi onye butere nje. O nwekwaraike ịbụ mgbaama onye nwere ọrịa akụrụ maọbụ na mmiri adịghị onye ahụ n'ahụ. Amịrị ọbụla kochiri ekochi na-agbọ ụfụfụ karịa nwekwaraike igosi na onye ahụ nwere ezigbo ọrịa n'ime ahụ. Mgbe ụfọdụ ndị dọkịnta anaghị achọpụta ihe butere ya ngwa ngwa. Ọ bụrụ na amirị gị atụọ agwa karịa ụboch�� abụo maọbụ atọ, gbara gaa hụ dọkịnta gị. Ọzọ Ugwu sịkwa na ụshi amịrị nwekwaraike ịgba ama ọrịa dị mmadụ n'ahụ. Ọ sị na amịrị onye ọrịa shụga ji nwereike ịna esị ụtọụtọ ka ọnye tara mkpụrụosisi na-esi ụshị ọma maka ihe Bekee kpọrọ ketones dị n'amịrị ahụ. Mana ọ sịkwa n'ọgwụ ụfọdụ na-esipụtakwa n'amịrị mmadụ. Ndị ọkachamara ọzọ sị na amịrị anyụrụ ọhụrụ anaghị esị oke isi, mana amịri gbara oge n'esi kpataa. Ha sịkwa na nrị ụfọdụ nwekwaraike isipụta na amịrị mmadụ dịka galik, kọrị, Salmọn, coffee na ndị ọzọ. Cheta na anyi mere maka pH mgbe anyí mere akụkọ maka mmiri akalaịn. Ndị ọkachamara sị na akalaịn dị na amịrị dị mma kwesiri isite 4.6 ruo 8 pH, ebe 6 bụ etiti ya. Ihe kacha ebute mgbenwe n'ime ya bụ ụdị nrị mmadụ riri. Iji maa atụ, nrị nwere protin na-ebutekarị amịri asidi, ebe akwụkwọ nri na-ebutekarị amịrị nwere akalaịn nwereike isi 4.6 ruo 8 pH. Mgbe ụfọdụ, ihu amịrị na adị ka ọnwere anwụrụọkụ n'ime ya. Mgbe ụfọdụ ọ chapụkwa ka mmiri nkiti. Ndị ọkachamara sị na amịrị nkịtị kwesiri ịchapụ nke bụ na e kwesiri ihu ike efere anyụnyere ya anya na-enweghị mgbochi ọbụla. Mgbe ụfọdụ okochitụ ekochi dịka ihe anwụrụọkụ dị na ya. Ọ bụrụ na o kochie nnugwu ka ihe agbarịnyere nzu, mara na ọ nwere ihe dị na ya. Onye ahụ kwesiri ịga nnyocha ịchọpụta ka ọnwere nje maọbụ ogbochi dị n'ụzọ amịrị si apụ. Ekwesighị ịleghere ụdị ihe a anya maka na ọ nwereike ibụ mgbaama ọrịa dịka ọrịa shụga, maọbụ ọrịa ndị ọzọ dị ọjọọ. Ihe ndị a ka nyocha nwereike igosi gị n'amịrị gị dịka nchọputa si gosi. Dọkịnta Chris Ugwu sị na ọ bụrụ na ịnyụọ amịrị n'abalị hụ ahụhụ na ya n'ụtụtụ, mara na shụga karịrị na ahụ onye ahụ. Ọtụtụ ihe anyị na-eri nwekwaraike ịme ka amịrị anyị na anyụ pee nta maọbụ buo oke ibu, otu ahụ ka ọ dịkwa ọbara dị anyị n'ahụ. Mmiri na mmanya anyị na aṅụ nwereike ibute oke amịrị ebe kafin (caffeine) nwereike ịbutu ọbara mmadụ nwekwaike bute ọbara mgbalielu. Mmụta na-akọwa na ụfọdụ ọgwụ mmadụ na-aṅụ na-eme ka mmiri ahụ mmadụ na-amịrịr peempe nke na-ebute oke ịnyụ amịrị. Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị maka maamịrị. Ugboro ole ka ị kwesiri ịnyụ amịrị n'ụbọchị? Ndị ọkachamara sị na onye ahụ dị mma kwesiri ịnyụ amịrị ihe dịka ugboro isii maọbụ asatọ n'ụbọchị. Ọ karịa otu a, o nwereike ịbụ na ihe ndị a na-eme onye ahụ: Maọbụ na ọkpụkpụ ukwu onye ahụ eriela mperi site na ịmụ nwa. Ọ bụru na ị na-aṅụ mmiri otu o kwesiri ka na anyụ oke ammịrị, gbara gaa hụ dọkịnta gị. Onye gbagolitegoro n'afọ nwekwara ike ịnyụ amịrị karịa otu okwesiri maka na ihe na-akpagbara ụbụrụ ya ama mgbe ekwesiri ịnyụ amịrị Bekee kpọrọ ""antidiuretic"" anaghịzị arụ ọrụ nke ọma. Gịnị mere amịrị ji akpa mmadụ mgbe onye ahụ na-ara otu? Ndị ọkachamara sị na ụdị ihe a anaghị emekawa ụmụnwoke maka na akpa amịrị nwoke na-emechi mgbe uhe (sperm) onye ahụ chọrọ ipụta. Mana ahụ nwaanyị, akpa amịrị ya na otu ya nọketere nke bụ na ahụ ya nwereike ịkpalite amịrị mgbe ọ chọrọ ""ịbia"". Mgbe ụfọdụ amịrị na-abalahụ ha mgbe ha bịawara. Ijide amrịrị onwere ihe ọ na-eme n'ahụ? Ebe dọkịnta Chris Ọzọ Ugwu sị na ịkpachi amịrị nwereike ibutere mmadụ ọgbatauhie, nchọpụta ndị Columbia University mere gosiri na onweghị ihe dị njọ n'ime ya karịa ịba amịrị n'akwa gị. Gịnị mere amịrị ji abakarị ụmụnwaanyị dị ime maọbụ ndị mụrụ nwa? Ịmụ nwa nwereike ịme ahụ nwaanyị ka ọ dọtịa n'ụdị ga na-eme ka ọ na-aba amịrị. Afọime nwekawaraike ịkpado akpa amịrị n'ụdị ga-eme ka amịrị na-apụta mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na nwa dị n'afọ buo oke ibu nke a ga-eme ka nwaanyị dị ime na-aba amịrị." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53274797 +politics Imo House of Assembly: Hope Uzodimma anabatala onyeisi ụlọomeiwu Imo ọhụrụ ahọpụtara ụnyahụ "Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma anabatala onyeisi ụlọomeiwu ọhụrụ bụ Kennedy a họpụtara ụnyahụ bụ November 9,2021. Amara Iwuanyanwu bụ osote ụlọomeiwu achụtụrụ achụtụ depụtara nke n'akara social midia taa bụ November 9, 2021. Iwuanyanwu mechara tinye foto ebe ya , gọvanọ Uzodimma nakwa Kennedy Ibeh kwụ see foto. Cheta na ndị ụlọomeiwu isii nke Amara Iwuanyannwu (bụ osote onyeisi ụlọomeiwu achụtụrụ na mbụ) nọ n'isi ya chụtụrụ Paul Emeziem bụbụ onyeisi ụlọ omeiwu ahụ. Ụfọd��� ndị ọmeiwu n'Imo steeti ewepụla Paul Emeziem dịka onyeisi ụlọomeiwu na steeti ahụ ma họpụta Kennedy Ibeh ka ọ nọchite ya n'oche. Onye omeiwu bipụtara ozi a bụ Chigozie Nwaneri, onye kwuru na Paul Emeziem metọrọ ọkwa oche ahụ. O so na ndị omeiwu isii, Emeziem kwụsitụrụ ọrụ n'ụbọchị Julaị 8, 2021 dịka o boro ya maka nrụrụaka. Ibeh na-anọchite anya ndị Obowo n'Imo steeti, banyere oche ahụ n'afọ 2015 ma nwete ọkwa ahụ n'afọ 2019. Okwu pụtara mgbe ndị ụlọomeiwu Imo steeti ruru isii nke Amara Iwuanyanwu nọ n'isi ya, banyere n'ụlọ ahụ n'ike ma chụtuo onyeisi ya bụ Paul Emeziem. Nke a mere ka ndị ụlọomeiwu nta họpụta onyeisi ọhụrụ. Tupu a chụtuo Emeziem, egechiri ogige omeiwu ahụ, ma jụ ka ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ ghara ịbanye oge ahụ. E kwekwughị ka Emeziem bata n'ụlọomeiwu ahụ mgbe ọ chọrọ ịbata taa. Kennedy Ibeh bụ onyeisi ọhụrụ ụlọomeiwu Imo ugbua gwara onye ntaakụkọ anyị n'ekwentị na ọ ga-eme ihe niile dị n'ike ya ime ka onye ụlọomeiwu sonyere n'ihe ọbụla a na-eme. Emeziem gwara onye ntakụkọ anyị na nchutu achụtụrụ ya bụ ihe ""ụmụaka"", na o nweghi isi. Ibeh si mpaghara Obowo. BBC Igbo chọpụtara na ya bụ mwepụ erughi nkeji ise dịka onye ọbụla lasara ebe ahụ. Aka m adịghị na nkata nchutu a chuturu osote m n'ọkwa - Onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti Cheta na onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti bụ Paul Emeziem gọrọ ebubo na-ekwu na ọ kpara nkata ịchụtụ osote ya n'ọkwa. A chụturu Iwuanyanwu Amarachi n'ọkwa n'ehihie ụbọchị Tuusde dịka ndị omeiwu mmadụ iri na asatọ nwere mkpebi pụrụiche akpọrọ 'Resolution'. Nke a mere ka ụfọdụ ndị na-akwado Iwuanyanwu boo Emeziem ebubo na o ji nde naịra iri asaa (70m) kpaa nkata ịchụtụ Iwuanyanwu. ""Ndị Omo ma na Emeziem bụ onye kwụwara aka ya ọtọ agaghị esonyenwu n'ụdịri omume gụnyere ikwummadụ okwu azụ, ịkpa nkata ọjọọ nakwa ibo ndị ilo ya ebubo"" ka o kwuru. Ihe ọzọ o kwuru bụ na ọ bụ uche ọtụtụ ndị ụlọomeiwu ka o mere dịka ọrụ ya si nye. Cheta na ọ bụ n'ehihie Tuzde ka akụkọ gbọwara na a chụọtuola osote onyeisi ụlọoomeiwu Imo steeti bụ Amarachi Iwuanyanwu n'ọkwa. A chụọtuola osote onyeisi ụlọoomeiwu Imo steeti bụ Amarachi Iwuanyanwu n'ọkwa. Nke a pụtara ihe dịka ụlọomeiwu steeti ahụ mechara nzụkọ iji kpaa ihe ga-eme mmadụ isii omeiwu achụturu n'ọkwa kemgbe ọnwa Julai afọ 2021. Iwuanyanwu Amara bụkwa onye na-anọchite anya gburgburu Nwangene dị n'Imo steeti kwa. Paul Emeziem bụ onyeisi ụlọọmeiwu ahụ kpọghachitara mmadụ isii achụbụru n'ọnwa Julai mgbe e nwere ọgbaghara n'ebe ahụ. Taa bụ mbụ a na-eme nzụkọ ụlọomeiwu ọbụla kemgbe afọ ise gara aga. Ekene Nndoimele bụ onye welitere okwu e ji chụpụ Iwuanyanwu kwuru na ọ bụ mkpebi ya na omeiwu iri abụọ na asaa ọzọ mere. Ọ kụwghị kwanu ebubo ọ bụ kpọm kwem e ji chutuo osote onyeisioche kama o detura ya n'akwụkwọ ma nyefee ya n'aka onyeisi ụlọomeiwu ahụ taa. Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ihe mere kọwara nke a n'onyonyo mgbasaozi anyị na ya mere n'ehihie ụbọchị Tuusde. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" https://www.bbc.com/igbo/afirika-59106180 +politics Suspension of 27 Imo LGA chairmen, councillors: 'Ihe mere anyị ji gbaa Ihedioha akwụkwọ n'ụlọikpe' "Ndị kaụnselọ 604 dị n'okpuru ọchịchị 27 a chụrụ n'ọrụ n'ike n'Imo akọwaala na ihe mere ha ji gbaa Gọvanọ Emeka ihediọha akwụkwọ n'ụlọikpe bụ n'ihi na ""o megidere iwu Naijiria"" site na ịchụ ha n'ọrụ."" Ndị kaụnselọ okpuru ọchịchị iri abụọ na asaa a chụdara n'ike n'Imo steeti kpụpụrụ aka na-achị gọvanọ steeti ahụ bụ Emeka Ihedioha na ndị omeiwu steeti ahụ n'ụlọikpe ukwu nke etiti nọ n'Owere. Ha na-agbagha ọchụchụ n'ọrụ nke a chụrụ ha n'abali atọ nke ọnwa Juun afọ dịka ụlọomeiwu steeti ahụ siri kpebie ma were kọmịti nlekọta anya dochie ha. Otu onye na ime ndị kaụnselo ọ metụtara bụ George Uke gwara BBC Igbo na ya bụ ihe bụ ""ihe ụlọikpe kachasị kpebiriela dịka ha kagburu mkpebi Ụlọomeiwu nke steeti ahụ kpebiri."" Uke, onye bụ otu n'ime ndị kaụnselọ n'Okpuru Ọchịchị Ideatọ-North, sị: ""Etu gọọmenti etiti enweghị ikike ịchụlị ndị a họpụtara na ntuliaka dịka ndị gọvanọ n'ọrụ, ndị gọvanọ enweghị ikike ịkwusị ndị kaụnselọ ọrụ."" Uke onye kwuru na ọ bụ n'afọ 2021 ka ha kwesiri ibi ọrụ ha, kwuru na o nweghị mgbe e nyere ha akwụkwọ na a chụrụ ha n'ọrụ. ""A chọọ ịchụ n'ọrụ, a ga enye gị akwụkwọ ga-ekwu na a chụrụ na ihe kpatara ya, mana o nweghị akwụkwọ ịchụ n'ọrụ anyị hụrụ."" ""E jighị ịma ọkwa achụ mmadụ n'ọrụ."" O gara n'ihu kọwaa na ha enwetala ntuziaka ụlọikpe si ha bido ọru ganye mgbe e biri ikpe ahụ. O kwuru na ha ihe nwere ike ibute ọgbaghara na ssteet ahụ dịka ya bụ ihe metụtara ndị APC, ebe ndị ọhụrụ bụcha ndị PDP. ""Ha chọrọ iji okwu 'suspension' meghaa ndị mmadụ anya.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48706966 +politics Christian Chukwu: Femi Otedola agbatala ọsọ enyemaka "Egwu ọma ejula ọnụ ndị be Christian Chukwu na-arịa ọrịa dịka akajiakụ bụ Femi Otedola kwetere ikwụ ụgwọ ụlọọgwụ ya. Ụgwọ ahụ ruru puku dọla iri ise. Ụlọọrụ mgbasa ozi ""Cable"" depụtara na Otedola mere nke a iji kwado onye o chere fere ala nna ya n'ụzọ dịmma. Otu akpọrọ Nigeria Football Federation ekwela nkwa ịnyere Chukwu aka. Chukwu onye dị afọ iri isii na asatọ chịrị otu egwuregwu bọọlụ Naịjrịa bụ Super Eagles mgbe ha mabutere iko mba Afịrịka mbụ n'afọ 1980. Cheta na gọọmenti Enugwu steeti gọrọ ụkwụ na aka na o nweghị mgbe ha gbahapụrụ Christian Chukwu bụ onye dara nnukwu ọrịa ugbua. Udedi Joseph bụ Kọmishọna egwuruegwu na-ekwu na gọmentị Enugwu akwụọla ụgwọ ihe niile na onye ọbụla na-arịọ ego n'isi ya bụ onye nrụrụaka. Ọkụ gbara n'ọdọụgbọelụ Sam Mbakwe dị nOwere Ọdọụgbọelụ Sam Mbakwe dị na Owere gbara ọkụ n'ehihie Monde. Ihe ọma dị ya bụ na emenyụọla ya bụ ọkụ ebe ebugharịrị nfeda ụgbọelụ. Ụlọikpe Ukwu akwọpụla aka n'isi Magnus Abe Ụlọikpe ụkwụ dị na Pọtakọt a tụfuola akwụkwọ Magnus Abe gbara ịgbagha onye meriri na ntụlịaka imeụlọ ndị APC mere na Rivas Steeti. Nke a mere dịka otu akụkụ APC na Rivas họpụtara Tonye Cole, ebe nke ọzọ họpụtara Abe dịka onye ga-efe ọkọlọtọ pati ahụ na ntuliaka 2019. Chief Justice Nigeria bụ Ibrahim Mohammed kpebiri ụbọchị Monde na ya bụ okwu enweghi isi na ọdụ. Tanzania ga-eso mechie 'water proof' Ụlọikpe ụkwụ dị na Pọtakọt a tụfuola akwụkwọ Magnus Abe gbara megide onye meriri na ntụlịaka imeụlọ ndị APC mere na Rivas Steeti. Chief Justice Nigeria bụ Ibrahim Mohammed kpebiri ụbọchị Monday na ya bụ okwu enweghi isi na ọdụ. N'egwuruegwu, Anyị na-echebiri asọmpi Chelsea na West Ham n'abalịa, Otu kpọrọ onwe ha International Organisation for Migration ekwuola na ọnweghị mgbe ha ji kwuo na iri na izu ahụ mmadụ juru eju na mba Middle East. Onye kwuru nke bụ ọnye ọnụ na-eru n'okwu na otu ahụ bụ Ikechukwu Attah. Ndị agha Naijiria Akụkọ kwuru na ụgbọala Hilux nke ndị agha Naijiria kuturu nwaanyị na-agara onwe ya ka ọ chọrọ ịgbafe okporoụzọ ụbọchị Fraide. Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọdachie ahụ akaghị ime ma ọ bụụ ụgbọala ahụ agbaghị n'okporo o kwesghị ịgba ma jirikwa oke ọsọ mee nke a. Mana isiụlọọrụ ndị agha Naijiria kwuru n'akụkọ na ha eletaghị nwaanyị ha merụrụ ahụ abụghị eziokwu. Na nkọwa ha, ha kwuru na ha bugara ya ụlọọgwụ ma kwụkwara ya ụgwọ ụlọọgwụ. Ha kwukwara na ha kpọkwara ndị ezinaụlọ nwaanyị ahụ ndị biara na-eleta ya n'ụlọgwụ. Onyeisi ndị uweojii bụ Bala Elkana ekwuola na ndị ntọrị nwụchịkọrọ Rashidi Musibau na mmadụ isii ọzọ na mpaghara Ikorodu n'abalị Satọde akpọbeghi ezinụlọ ndị ha tọọro. Rashidi Musibau bụ otu n'ime ndị isi ndị ọrụ gbatagbata na Legọsi. Elkana kwuru na ndị ntọrị tọrọ ya na mmadụ isii ndị ọzọ ya na ha so n'ime obodo Ikosi-Ejirin, ọ sị na ndị ntọrị si ebe mmiri nọ wee gbochie ha n'ụzọ, tọrọ ha gbaba n'ime ụgbọ mmiri ha. Ihe nya mmiri mere mgbe mberede kwanyere otu onye agha si agha lọta na mma ụgbọelu nke bere isi ya tọgbọ. Eniela nwa amadị a so ebuso Boko Haram agha n'usoro ndị alakuba. Ndị ọrụ gbata gbata na Maịduguri na-akọwa na ndị nara mụọ site na ogbunigwe ndị omekome abụọ gbara ụnyaahu eruola mmadụ ise ka ndị ihe a metụtara n'eru mmadụ iri anọ na ise. Ihe a mere mgbe ndị a na-eche na ha bụ ndị Boko Haram gbara ogbunigwe ha bu n'ahụ na obodo Muna Dalti. Onyeisi ngalaba na-ahụ maka nchekwa obodo na mba Amerịka bụ Kirstjen Nielsen esorola n'ime ndị Onyeisiala Donald Trump tinyere n'ọrụ tinyere akwukwọ arụkwaghịm. Nwaafọ Naịjirịa bụ Odion Ighalo so na ndị denyere aha ya n'akwụkwọ mgbe Shanghai Shenhua ji ọkpụ goolu ise asatara otu sị Beijing Renhe ntọọị n'asọmpị Chinese Super League asụru ụbọchịụka" https://www.bbc.com/igbo/afirika-47844014 +business Ka m si jiri naanị dọla ise bido ahịa nri a na-anụ aha ya na Sierra Leone John Nzeribe bụ onye Naijiria na-ere nri ndị be anyị na mba Sierra Leone.\n\nỌ gwara BBC Igbo na mkparítaụka na ya bụ ahịa na-eweta nnukwu ego mana ọ malitere ya, n'obere oge ọ bịara obodo ahụ, o nweghị ego, nka maọbụ akaọrụ ọzọ. Nwa amadi ahụ onye kọwara na nne ya rebiri nri n'Ariarịa Aba, kwuru n'ezie na dịka nwoke, na ya etinyeghị anya n'ọrụ nne ya na-arụ were ruo hụrụ onwe ya n' ọnọdụ nnukwu ụkọ na Sierra Leone.\n ihe o jiri.\n\n\nGee ihe o kwuru n'uju: John Nzeribe bụ onye si Owụwa Anyanwụ Naijiria bụ mpaghara ndị e ji uchu na nje mbiri mara.\nNke a na-ebuga ha na mpaghara dị iche iche n'ụwa ebe na-aga ịchọ akara aka ha nakwa ebe ha ga-aba ụba. https://www.bbc.com/igbo/articles/cj5q4l1nm7lo +entertainment Sinach, Angela Okorie na ụmụnwaanyị Ebonyi state Nigeria enweghi ike ichefu aha ha "N'ezinaụlọ niile, nwaanyị bụ ngalaba ji isi ụlọ, etu a ka ọ dịkwa n'Ebonyi steeti nakwa Naịjirịa. Dịka anyị si wetara gị akụkọ ụmụnwaanyị Abịa steeti na-akpa ike nakwa ndị bụ agbara nwaanyị si Anambara steeti, anyị chọrọ igosi gị ndị nke si Ebonyi steeti. Ụmụnwaanyị Ebonyi mara mma, ma nwekwaa ụbụrụ, nke mere ka ha na-enwuke ebe ọbụla ha gara. Priscilla Ekwere Eleje Eleje bụ nwaanyị mbụ mbinyeaka ya (signature) na-apụta n'ego Naịjirịa n'ime afọ iri isii na otu (61). Ọ bụkwa nwaanyị mbụ ga-anọ n'ọkwa ""Director of Currency Operations"" n'ụlọakụ etiti a kpọrọ Central Bank (CBN) n'olu Bekee, na Naịjirịa. Ọ bụkwa nwaanyị agụmakwụkwọ anaghị ara ahụ, dịka o nwere asambodo dị iche iche gosiri na ụbụrụisi ya na-apụ ọkụ. Uche Azikiwe Na Azikiwe lụrụ otu dike ala Igbo na Naịjirịa bụ Nnamdi 'Zik' Azikiwe abụghị naanị ihe aha ya ji dịrị n'ime akụkọ a. Ị ma na Azikiwe bụ ọkammụta na mahadum Nsụka? O sokwa na ndị nọ n'oche na-ahụ maka etu ihe si aga n'ụlọakụ etiti (CBN). Azikiwe so na ndị nwetarala ihe nrite Member of the Order of the Federal Republic (MFR). A mụrụ ya n'ụbọchị anọ nke ọnwa Febrụwarị, 1947. Osinachi 'Sinach' Joseph (Kalu) Sinach dịka e si mara ya, bụ otiegwu pụrụiche. Ihe gbasara Chineke na ụka Kraịst na-amasị ya nke ukwu, mere ka ọ na-eti naanị egwu ụka. A ga-ekwu ole ghara ole? Ọ na-agụ agụ, ma na-edekwa ede. O nwetala ọtụtụ ihe nrite maka egwu ya. A mụrụ ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Maachị, 1973. Angela Okorie Ị jụọ mmadụ ""kedụ aha ndị a ma ama si Ebonyi steeti?"" ma ha akpọghị aha Okorie, mara na onye ahụ amaghị steeti ahụ. Okorie so na ndị aha ha na-ada ụda na Nollywood, ebe o merela ọtụtụ ejije. A mụrụ ya n'ụbọchị 18 nke ọnwa Ọgọstụ 1986. Charity 'ChaCha' Eke-Faani Eke bụ onye na-eme ejije na Nollywood. N'agbanyeghi na ọ ka bụ ezigbo nwaagbọghọ, o meela ọtụtụ ihe nkiri karịrị otu narị. A mụrụ ya n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee, 1993. Grace Amah Ị bụrụ onye na-ele ihe nkiri ndị Nollywood mgbe gboo, ị ga-amarịrị onye Amah bụ. Aha ya wuru ewu ọfụma oge ndị dị ka Sandra Achums, Regina Askia na Rita Nzelu ""na-achị"" Nollywood. A mụrụ ya ụbọchị 23 nke ọnwa Febrụwarị. Maria Ude Nwachi Nwachi bụ aka ochie n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'Ebonyi steeti. Ọ rụọla dịka onye omeiwu nta na-anọchite anya ndị Afikpo Nọt-Ist. Ọ bụ ya hibere otu ndị Igbo kacha nwee mmadụ na Facebook. A mụrụ ya ụbọchị 29 nke ọnwa Septemba, 1970. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49476480 +politics Ihe anyị ga-eme maka ndị eduru n'iyi ọrụ n'Ebonyi - PDP "Onye ọkaiwu na-anọchite anya otu PDP n'Ebonyi steeti ekwuola na ha ga-akpụpụ gọọmentị Ebonyi steeti ụlọikpe maka ndị isi okpuruọchịchị ha duru n'iyi ọrụ ụnyyahụ. Nwoke ahụ aha ya bụ Mudi Erhenedi gwara BBC Igbo n'ekwentị na ihe ahụ emere n'Ebonyi steeti bụ ịmegide iwu ụlọikpe nyere nke pụtara 'Contempt of Court' na Bekee. Ọ kọwakwara na ha ga-aga ihu hụ na ụlọikpe kagburu ikike enyere ndị ahụ eduru n'iyi ọrụ. ""Ụloikpe ekwubuola na ihe ha ntuliaaka iji họpụta ndị ahụ dara iwu nke pụtara na idu ndị ahọpụtara n'iyi ọrụ bụ ikparị ụlọikpe"" ka Irenede kọwara. Mana Uche Orji bụ Kọmịshọna mgbasaozi n'Ebonyi steeti kwuru na o nweghi eziokwu dị na ihe otu PDP na-ekwu. Ọ sị na mkpebi ụlọikpe mere bịara dịka emecharala ntuliaka ahụ nke mere na ọ bụ 'Academic Exercise'. O kwukwara na ọ bụkwa afọ abụọ ka ndị ahụ eduru n'iyi ọrụ ga-anọ n'ọkwa n'abụghị afọ atọ dịka ndị kpụpụrụ ha ụlọikpe si kwu. ""O nwere iwu Ebonyi steeti mere n'afọ 2020 kwuru ka ndị isi okpuruọchịchị nọrọ n'ọkwa naanị afọ abụọ"" ka ọ gwara BBC n'ekwentị. Okwu dị na ntuliaka okpuruọchịchị malitere mgbe e mere ya ntuliaka ahụ n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Julai. Mpụtara ntuliaka ahụ gosiri na otu APC meriri n'okpuruọchịchị niile dị na steeti ahụ dị iri na atọ. Otu PDP gara n'ụl��ikpe gbaa gọọmentị steeti ahụ akwụkwọ ma na-ekwu na enyeghi ha iwu eji me ya bụ ntuliaka. Ụlọikpe kpebiri na ntuliaka ahụ dara iwu dị n'ime Electoral Act 2022. Ha kwukwara na o megidere iwu kwadoro ọchịchị onyekwuouche ya nke pụtara na o nweghi ebe ọ kwụ akwụ. Mana dịka o si kwuru ugbua, eduola ndị ahụ meriri ntuliaka n'iyi ọrụ na steeti ahụ." https://www.bbc.com/igbo/articles/cw5d35kvkdyo +health Lekwa ihe anyị chọpụtara maka ọrịa leukemia Ihe omimi dị na ya bụ ọrịa Bekee kpọrọ leukemia karịrị akarị. Ka ọ gburu nwata, ka o gburu okenye. Dọkịnta Bekee bụ Uche Okeke, onyeisi n'ụlọọgwụ gọọmentị dị n'Enugwu Ukwu, Anambra steeti kọwadara ala ka ya bụ ọrịa si ebido na mgba ama ya. kirie ya n'uju. https://www.bbc.com/igbo/56514780 +business Igbo Arts: Etu m si eji uli Igbo emepụta akwa ọgbaraọhụrụ bụ sọ mma - Uchechukwu Ezeemo Omenala Igbo were ihe nka dị icheiche e ji mara ya ma n'oge gboo ma n'oge ugbua. Uli bụ otu ihe ụmụagbọghọ ji achọ onwe ha mma n'oge mbụ, mana ọ dị ya bụ ihe a laala ugbua. Mana nwaokorobịa a bụ Uchechukwu Ezeemo achọpụtala ihe ọzọ e ji ya eme. Uchechukwu Ezeemo ji uli emepụta ụdị akwa dị iche iche bụ sọ mma. O gosiri BBC Igbo etu o si eme nke a. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Mgbeahuru. https://www.bbc.com/igbo/afirika-55467589 +politics 2019 Summary: Ntuliaka, mkpọrọ Orji Uzor Kalu na ihe ndị ọzọ kporo ọkụ na ndọrọndọrọ ọchịchị na 2019 Bido na ntuliaka iji họputa onyeisiala ruo na mkpọrọ a tụrụ aka chịburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu, Ị nwereike ikwu na afọ 2019 bụ chi bọọ a nụ ozo. Lee ihe iri kachasi kpoo ọkụ: 1. Mwepụ Ọkaikpe ukwu Onnoghen Onyeisiala Muhammadu Buhari wepụrụ Walter Onnoghen dịka onyeisi ọkaikpe n'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Jenụwarị. Buhari kwuru na ọ bụ maka ebubo nrụrụaka e boro Onnoghen kpatara o ji wepu ya n'ọkwa. 2. Mbugharịụbọchị ntuliaka Ka ọ fọrọ naanị elekere ole na ole ka oge ruo maka mbido ntuliaka 2019, Mahmood Yakubu bụ onyeisi INEC kwuru na e bugharịala ya bụ ntuliaka si n'abali iri na isii nke ọnwa Febrụwarị gaa abalị iri abụọ na atọ. Nke a tinyere onye ukwu na onye nta na gbagharia, ma mekwaa ka ndị mmadụ malite ikwu na ọ dị ka nrụrụaka abatala na ntuliaka ahụ. Mgbe Muhammadu Buhari pụtara ihe dịka onye meriri okwa onyeisiala, o mere ọtụtụ mmadu ndị n'ọchị ndị n'akwa. Atiku Abubakar bụ onye PDP kwuru na nnukwu nrụrụaka dị na ya bụ ntuliaka. Atiku gbara Buhari na ndị otu ya bụ 'All Progressives Congress' (APC) akwụkwọ n'ulọikpe, mana Buhari merikwara ya ebe ahụ. Uche Nwosu na Emeka Ihedioha gbara mgba ka dimkpa maka oche Govano Imo steeti, mana ọ bụ Ihedioha mechara merie. Nke a bụ n'agbanyeghi na Rochas Okorocha bụ aka na-achị Imo steeti oge ahụ dọnyeere Nwosu ukwu. Mana Rochas mechara zọta oche n'ụlọomeiwu ukwu n'agbanyeghi mgba ya na onwe ya gbara n'akụkụ nke ya maka oche ahụ. Gọvanọ Rivas Steeti bụ Nyesom Wike na Mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi gbara nnọọ mgba maka onye ga-emeri oche gọvanọ steeti ahụ. Ọ bụ ezie na Amaechi esoghi zọọ ya bụ ọkwa, mana ọ kwadoro Tonye Cole bụ onye otu ndọrọndọrọ 'Africa Progressives Congress' (APC). Nke a bụ n'ihi na INEC kụpụrụ ndi APC iso zoo ọchịchị na Rivas. Mana Wike meriri ma Amaechi ma Cole, kụọ ha abụọ ukwu n'ala. 6. Mwepụta ndị isi ụlọomeiwu Onye ọbụla chị obi n'aka oge a na-akwado ntuliaka maka ndị isi ụlọomeiwu ukwu na nke nta. Mana n'ikpeazụ, Ahmed Lawan na Femi Gbajabiamila tuuru ugo. Ike Ekweremadu so wee zọọ ya bu ọkwa, mana ọ chịtaghi aja. Dino Melaye kụrụ afọ n'ala na ndọrọndọrọ nke ndị otu PDP mere iji họputa onye ga-anọchite anya ha n'izọ ọkwa gọvanọ Kogi Steeti. Oteghi aka, ụlọikpe kagburu mmeri ya dịka onye omeiwu, ma kwuo ka e megharia ntuliaka ya. Mgbe e megharịrị ya, Melaye kụkwara afọ n'ala ọzọ wee ghọọ 'Aaron' gbara aka ala. 8. Nwụchi na mkpọrọ Sowore Ndị uweojii nzuzo bụ 'State Secret Service (SSS) nwụchiri Sowore n'ọnwa Ọgọstụ, ma tụọ ya mkpọrọ. Iwe ha bụ na Sowore chọrọ ịhazi ngaghariiwe a kpọrọ 'Revolution Now'. E mechara tọghapụ ya naanị otu ụbọchị tupu a nwụchie ya ọzọ. Sowore ka nọ na mkpọrọ ruo taa, agbanyeghi na ụlọikpe enyela iwu ugboro ugboro ka a tọhapụ ya. 9. Bọjeti 2020 Onyeisiala Buhari bugaara ndị omeiwu Bọjeti 2020. Ndị omeiwu mere ngwa ngwa itule ya bụ bọjeti ma kwado ya. Buhari binyere aka na bọjeti n'abalị iri na asaa nke ọnwa Disemba. Nke a bu nke mbụ kemgbe afọ 1999 onyeisiala na-ebinye aka na bọjeti n'ọnwa Disemba nke ga-eme ka ọ malite kpọmkwem n'abalị mbụ nke Jenụwarị. 10. Mkpọrọ Orji Uzor Kalu Ụlọikpe dị na Legọs mara OUK ikpe maka nrụrụaka ma tụọ ya nga afọ iri na abụọ. Nke a gbara ọtụtụ mmadụ gharịị n'ihi na Kalu bụ onye otu All Progressives Congress (APC) bụ Pati nọ n'ochịchị. Ngalaba mgbochi nrụrụaka bụ EFCC kwukwara na ọtụtụ ndị jibu ọkwa gọvanọ ka na-agabiga nnyocha. Ka anyị chebiri afọ 2020 makana ọ dị ime! Onye ma nke ndọrọndọrọ ọchịchị ga-amụta? https://www.bbc.com/igbo/afirika-50807058 +business BBC Africa Eye: Ndị Crowd1 abụ ndị wayo ka ha abụ nke ezigbo? "BBC Africa Eye mara imi n'ala ịchọpụta ma ụlọọrụ Crowd1 kwuru na ha anaghị egwu ndị mmadụ wayo abụ ndị wayo n'ezie. Ha kwuru na ha bụ ihe Bekee kpọrọ ""Network Marketing"", mana site na nnyocha BBC mere, ọ dị ka e nwere ndị ọ na-adabara karịa ibe ha. Otu nwaanyị tụfuchara ego niile o nwere n'ụwa ka ọ na-achụ nta ego ndị Crowd1 kwere ya na nkwa, kọwara etu obi si agbawa ya n'ihi na ọ bụrụla ogbenye ọnụ ntụ. BBC chọpụtakwara na nkwa niile ndị Crowd1 na-ekwe ndị mmadụ na ha ga-eme ha ọgaranya abụchaghị n'ezie n'ihi na e nwere ndị ego a na-aba n'akpa ha karịa ndị ọzọ. Lee ihe niile BBC Africa Eye chọpụtara maka ha na ebe ha kwụ ugbua n'uju:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-54764856 +entertainment Igbo Language: Ashawo, Iyori. Osikapa na okwu ndị ọzọ dị n'asụsụ Igbo e bitere n'asụsụ ndị ọzọ "Asụsụ Igbo bụ asụsụ bụ otu n'ime ihe e jiri mara ndị Igbo. Ya bụ asụsụ bụ asụsụ ị ga-anụta n'ụfọdụ asụsụ maọbụ okwu ndị mpaghara ọzọ na-abụghị ndị Igbo na-asụ. Ị ga-enweta ya etua ọ kachasị na mba Jamaica. Dịka ndị Igbo na-eti aka n'obi jiri asụsụ ha eme ọnụ, ị mara na-enwere ụfọdụ okwu dị n'asụsụ Igbo ndị Igbo na-asụ bụ nke ha bitere ndị mba ọzọ. Ọkammụta n'ihe gbasara asụsụ Igbo na mahadum 'Univertsity of Lagos' bụ Chigozie Nnabuihe gbara ama n'ezie na e nwere ụfọdụ mkpụrụokwu a na-ewe dịka asụsụ Igbo mana ha bụ mkpụrụokwu e bitere ndị mba ọzọ. 1) Agboro dịka ndị Igbo sị akpọ ya bụ okwu ha bitere n'aka ndị Yoruba. Agboro bụ okwu Yoroba a na akpọ Agbero Ndị Yoroba na-akpọ 'agbero' nke pụtara onye na-achọta ndị njem. 2) Ashawo bụ mkpụrụokwu ọzọ e bitere ebite. Okwu ahụ nke e bitere n'aka ndị Yoroba bụ 'ashewo' n'asụsụ ha. Nnabuihe kwuru sị, "" N'asụsụ Yoroba, 'ashewo pụtara onye na-eji ahụ ya ahụ ọrụ arụta ego"". O kwuru sị, "" Ndị Igbo chọrọ ịnweta nke ha were kpọọ ya 'Akwụna Akwụna' n'ihi na ha na-akwụ n'ụzọ. 3) Osikapa bụ okwu e bitere n'aka ndị Awụsa nke bụ 'shinkafa' Nnabuihe Kwuru na osikapa bụ okwu ndị Igbo bitere n'aka ndị Awụsa. Ọ kọwara na ọ bụ ndị Igbo nọ n'Ebonyi Steeti dịka ndị Abakaliki ndị ala ha nwereike ịkọpụta osikapa dịka ala ndị Awụsa sị akọpụta. O kwuru na ndị Abakaliki bụ ndị na-akọ osikapa ma kọwaa na ndị Igbo enweghị osikapa na ndụ ọdịnala ha. O kwuru sị, "" Ọ bụ ndị Ebonyi tinyere ya 'O' na ebe enwere 'F' ha akpọọ ya P, nke pụtara 'oshikapa'. Kama ọ kọwara na ndị Igbo ndị nọ n'elu ala kpọrọ ya Osikapa. 4) Ịchafụ bụ mkpụrụokwu ndị Igbo bitere n'aka ndị Frenchi dịka nnabuihe siri kọwaa. Ịchafụ bụ mkpụrụokwu ndị Frenchị nke bụ Chiffon. 5) Iyori nti bụ okwu e bitere n'aka ndị Inglishi bụ 'Earring'. Nnabuihe kwuru sị, "" Ndị Bekee na-akpọ ya ;eatring' ,ebe ndị igbo na-akpọ ya 'Iyori ntị"". 6) Nkọm (Ngaji) bụ okwu ndị Ohafia bitere n'aka ndị Kalaba Nnabuihe kwuru na ndị Ohafia na ndị Kalaba na-eke otu oke ala. O kwuru sị, "" Ndị Ohafia na-akpọ ngaji Nkọm nke bụ okwu ha bitere n'aka ndị Ohafia. 7) Ekpe na Ekpo bụ okwu Ohafia, Abiriba,Ibeku na ebe ndị ọzọ bitere n'aka ndị Kalaba Nnabuihe kọwara na aha ndịa nke bụ otu na mmanwụ bụ aha ndị Igbo nwere ihe ndịa bitere n'okwu ndị Kalaba. 8) Ọkọn bụ ihe ọzọ ndị Ohafia na Abiriba bitere n'okwu ndị Kalaba Nnabuihe kọwara na ọ bụ emume ndị mmadụ ji eme awansị. O kwuru na ọ bụ egwu ọdịnala, ma kọwaa na ọkọn bụ okwu e bitere ndị Kalaba. Nnabuihe gara n'ihu kwuo na enwere ụfọdụ okwu ndị Igbo na ndị mba ọzọ na-akpọkọrịta kama na ọ maghị ndị bitere n'aka ibe ya. A) Ogede - Nnabuihe kwuru na dịka ụfọdụ ebe na Anambra na-akpọ Abịrịka Ogede, ma kama ndị Yoruba na-akpọ nke ha Ogede. B) Ori- Ọ kwukwara sị, ""Dịka ụfọdụ mpaghara Igbo na-akpọ Okwọma Ori, ndị Yoruba na-akpọ kwa ya Ori"". Mana Nnabuihe kọwara ọ maghị ndị bitere okwu ndịa n'aka ibe ya." https://www.bbc.com/igbo/61040151 +health Hand Sanitizer: Lee etu ị ga-esi rụpụta nke gi Mmadụ idebe aka ya ọcha bụ ụzọ kacha dị ire iji gbanahụ ọrịa na-efe efe dịka coronavirus. Mmiri nkwọcha pụrụ iche Bekee kpọrọ 'hand sanitizer' dị nnọọ nnukwu mkpa ugbua. 'Hand sanitizer' na-adazi oke ọnụ n'ahịa ugbua. Mana egwu atụla gị, lee etu i nwere ike isi rụpụta nke gi na-emefughi nnukwu ego. Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Vining Ogu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-52024159 +politics Anambra Governorship Election: Obi siri m ike na m na m ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ Anambra - Chukwuma Soludo "Chukwuma Soludo ekwuola na obi siri ya ike na ọ ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti na ntuliaka a ga-eme na Nọvemba 6. Soludo kwuru nke a na mkparịtaụka ya na Channels TV na mgbede Mọnde, dịka otu ụlọikpe dị n'Awka, Anambra steeti, nyere iwu ka INEC tinyeghachi aha ya dị ka onye ga-anọchi pati APGA na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti. Mana ọtụtụ na-ekwu na ya okwu ebibeghị, n'ihi na ụlọikpe ka elu ekpebibeghị ya bụ ikpe. Ka ọ dị ugbua, ụlọikpe 'high court' abụọ enyela mkpebi n'okwu gbasara APGA n'Anambara steeti, nke pụtara na ọ bụ ụlọikpe 'appeal court' ga-ekwuzi ihe Inec ga-eme. Lee ihe bụ isiokwu Cheta na ngalaba 'Independent National Electoral Commission' wepuru aha Soludo ma tinye aha Chukwuma Umeoji n'akwụkwọ ha biputara n'izuka gara aga. Nke a bụ maka na pati APGA kere ụzọ abụọ ma nwee mmadụ abụọ na-azọ ọkwa onyeisioche, Victor Oye na Jude Okeke. Otu ụlọikpe dị na Jigawa nyere iwu na ọ bụ Jude Okeke bụ ezigbo onyeisi Apga na Naịjirịa, ọ bụghị Victor Oye. Nke a mere ka INEC were aha Chukwuma Umeoji, bụ aha nke otu Jude Okeke zigara, ma hapụ Soludo bụ aha otu Victor Oye zigara. Mana taa bụ Mọnde ka ọkaikpe Valentine Okaa nyere iwu n'Awka na ọ bụ Victor Oye bụ onyeisioche APGA n'Anambra steeti, nke pụtara na ọ bụ ntuliaka nke ha haziri ka INEC ga-ewere. Otu n'ime ndị enyemaka mgbasaozi Soludo bụ Mazi Ejimoro Opara gwara BBC Igbo na nke a mere eme n'ụbọchị Mọnde a. Ejimofor kwuru sị: ""Ọ bụ eziokwu na ụlọikpe ukwu steeti etinyeghachila Soludo dịka onye ga-anọchi anya APGA na ntuliaka Novemba 6."" ""Ụlọikpe ahụ kwukwara na ọ bụ Victor Ike Oye bụ onyeisi APGA na Naịjirịa."" Ejimofor gara n'ihu kwuo na ọ dịziiri INEC ugbua itinyeghachi aha Soludo dịka ụlọikpe si nye iwu. Ọ kọwara na ụlọikpe dị na Jigawa nke nyeburu iwu na Victor Oye abụghị onyeisi APGA enweghị ikike inye ya bụ iwu n'ihi na ebe esemokwu na-ada bụ n'Anambra. Ndị ọkaiwu anyị ka na-agakwa okwu ya iji hụ na INEC tinyeghachiri aha Soludo. Mana Azubuike Okafor, bụ onye na-akwado Chukwuma Umeoji gwara BBC na INEC agaghị eme ihe ụlọikpe ahụ dị n'Awka kwuru. Okafor kwuru sị: ""Okwu a nọzi n'ụlọikpe mkpesa bụ 'appeal court' ugbua, nke a pụtara na ọ gafeela ihe ụlọikpe steeti ga-ekpebi."" ""Ka ọ dị ugbua, INEC ejirila mkpebi nke ụlọikpe Jigawa nyere rụba ọrụ. Ha eweputela aha ndị ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ, ha agaghị alaghachi azụ ugbua n'ihi mkpebi ụlọikpe nke dị n'Awka."" ""Ọ bụ naanị ụlọikpe karịrị ụlọikpe 'hgh court' nwere ike ikwu ihe ọzọ INEC ga-ege ntị.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-57891979 +entertainment Igbo traditional wedding outfit: Uwe anyị na-eyi agba nkwu Ịlụ di maọbụ nwaanyị bụ ezigbo njem na ndụ mmadụ. Ọ bụ ihe mmadụ ole n'ole chọrọ ijide aka tupu ha ahapụ ụwa. N'ala Igbo, nwoke gara ịlụ nwaanyị ga-amara na ọ bụghị sọọsọ nwunye ya ka ọ na-alụ. Ọ na-alụkwa ndị be ya niile. N'otu aka ahụ, nwaanyị na-alụ di na-alụkwa ndị be ya. N'ihi nke a, onye ọbụla siri n'ezinụlọ ha abụọ na-etinyekọta aka ịhụ na mmemme gbasara ndị a na-achọ ịlụ onwe gara nke ọma. Ihe ukwu nke dị n'alụm di na nwunye bụ uwe ha ga-eyi n'ahụ makwa nke ndị ga-abịanụ ga-eyi. Ndị a bụ uwe dị icheiche ndị be anyị na-eyi n'ala Igbo. Uwe nwaanyị na-alụ dị na-adị iche maka ọ bụ ya ka onye ọbụla ga-ekiri ụbọchị ahụ. Nke nwoke na-apụkwa iche nke ya. Ọtụtụ ụmụ nwaanyị na-eme ịgbankwu na-eyị uwe elu na nke mwụda. Ọbụghị iwu na uwe a ga-enwe otu agwa, mana agwa akwa nwaanyị ga-eyi ga-emejurịta ibe ya. Aka uwe elu a nwere ike ịkwụsị ebe ọbụla. E nwere ike iji ọla akwa dị icheiche achọ ya mma. Uwe mwụda bụ ụdịrị akwa na-amasị ndị ibe nke nwunye na ndị agbọghọ bịara mmemme a. Ndị nwaanyị lụrụla di na-adị ama akwa n'ukwu. Ndị nwoke na-eyi uwe elu na traụza. Ụfọdụ na-ama akwa n'ụkwu. Nke a bụkwa uwe ọzọ dị mkpa n'ejiji alụm dị na nwunye dịka omenaala Igbo sịrị dị. Nwaanyị nwere ike ịsụ ịchafụ n'isi. E nwere ike itinye ola uwe n'ịchafụ nke nwaanyị ka ọma ezigbo mma. Nwoke na-ekpu okpu isi. O nwere ike ịbụ okpu na-acha uhie uhie, edo na ndị ọzọ. Uwe a na-eyi n'igba nkwụ nwaanyị anaghị ezu oke ma ọbụrụ na ola dị icheiche adịghị na ya. Ọla ọcha, ọla edo, kọral, ọdụ na ọla a na-etinye n'akwa. Ha juru eju. Nwaanyị na nwoke na-agba uwe olu na nke aka. Ọzọkwa, nwaanyị na nwoke nwere ike iji ọdụ ịnyịnya. Nwaanyị nwekwara ike iji akụpe n'aka ma ọ chọọ. Abịa na akpụkpọ ụkwụ, ndị nwaanyị na-eyi akpụkpọ ụkwụ mara mma. Ufọdụ na-eyi nke dị elu maọbụ nke ala ka ha nwe ohere ịgba egwu. Nke ndị nwoke bụ nke e ji akpụkpọ anụ mee. N'ikpeazu, nwoke nwere ike jide mkpọrọ o ji aga ije. https://www.bbc.com/igbo/afirika-44144615 +politics PVC registration: Etu ndị mmadụ si achụso inweta PVC ha "Oku inweta akwụkwọ e ji atụ vootu nke Bekee kpọrọ 'Permanent Voters Card' (PVC) ebirila ọkụ na mpaghara Naịjiria dị iche iche n'izu ole na ole gara aga. Dịka ihe siri kwụrụ ugbua,ọtụtụ ndị mmadụ ekpebiela na ha ga-esorịrị tụọ vootu a ga-eji họpụta onye ga-achị Naịjiria dịka onyeisiala na ntuliaka afọ 2023 maka afọ anọ na-eso ya. Dịka ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) si kwuo, ọnụgụgụ ndị na-edebanye aha ha ịnata PVC ha arịwala elu. Ndị mmadụ ewepụtala atụmatụ dị iche iche isi maa ọkwa ma hụ na ndị mmadụ ga-etozu ịtụ vootu na ya bụ ntuliaka a ga-eme n'afọ 2023. Na mpaghara dị iche iche, ndị ntorobia zikọrịtara onwe ha ozi na soshal midia ka ha gbakọọ hụ na ha debanyere aha ma nwee ike inweta ya bụ PVC. N'Enugwu, ọkachasị ndị ntorobịa bụ ndị na-agbakọ n'Okpara Square kemgbe izu a, dịka ha na-agba mbọ ịhụ na ha debanyere aha ha maka nnata PVC. Na Legọs, ndị ahịa Alaba International Market mara ọkwa ka ndị mmadụ ghara ịbịa ahịa echi bụ Tọzde, abalị itoolu nke ọnwa Juun, 2022. Ha kwuru ka onye ukwu na onye nta na-azụ ahịa ebe ahụ gbaa mbọ gaa nweta PVC nke ha. Onyeisi gburugburu ndị na-azụ ahịa 'Electronics' n'ahịa ahụ bụ Paulinus Ugochukwu, gwara BBC Igbo na ha chọrọ ka ndị na-azụ ahịa nwee ike ịtụ vootu n'afọ 2023, n'ihi na ọ bụ ""ọrụ dịịrị gị dịka nwa amaala"". O kwuru na ọ bụrụ na ha emechighi ahịa na ndị mmadụ agaghị eje nata PVC nke bụ na ụbọchị ntuliaka ha agaghị ihe ha ga-eji tụọ vootu. Maazị Ugochukwu kwuru na ọ bụ iwu ka ha tinyere, nke ha kpọrọ ""Operation show your PVC"", ma kwuo na ha chọrọ ka ndị ahịa ndị ọzọ ṅomie atụmatụ ha a. O kwuru na oge ga-abịa mgbe ha ga-eme ya ka ọ bụrụ na i jighi PVC gị, agaghị ekwe gị bata ime ahịa. O kwuru na enweghi ihe o mere ma ọ bụrụ na otu ụbọchị fulaghị ha ebe ha na-achụ nta PVC ha, na ha na ndị ahịa nọ na nkwekọrịta. Ụfọdụ ndị mmadụ gụnyere ndị otiegwu a ma ama ewepụtakwuola oge ha na ụbọchị ha iji chụọ nta PVC na mpaghara Legọs dị iche iche. Ha mere ya ka ọ bụrụ na tupu ị bata n'ọgbọ ebe ha ga-anọ eti ya bụ egwu, ị ga-ejirịrị PVC gị." https://www.bbc.com/igbo/articles/cw0gykgr15jo +entertainment Nigerian music: Ihe mere o ji dị ka ndị Igbo na-ala azụ n'egwu - Ruffcoin Nwa Aba "Nwa afọ Igbo a ma ama na-eti egwu aha ya bụ Ruffcoin Nwa Aba tinyere ọnụ n'okwu banyere ndị kachasị ewu ewu na Naịjirịa. Ọ gwara BBC Igbo na ndị mpaghara Ọdịda-Anyanwụ kachasị ewu makana ọ bụ n'aka ha ka ihe mgbasaozi kacha dị na Naịjirịa. O kwuru sị, ""Ọ bụ ha kacha nwee ụlọọrụ mgbasaozi, nke mere o ji na-enye ndị be ha ohere iwepụta egwu ha ka ndị mmadụ mara na ha ka nọkwa ya."" Ọ gara n'ihu sị na ndị Ọwụwa-Anyanwụ kwesịrị itinye uche mee ka ha gbagote n'ọkwa. Nwaamadị a gakwara n'ihu dụọ ndị ntoroọbịa ọdụ ka onye ọbụla jisi ike n'ihe ọbụla ọ na-eme. Nwa Aba kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị BBC Igbo nwere n'ihe omume a kpọrọ ""Gịnị na-afịọ?"". Ọ kọwara na ọ bụghị taa ka o bidoro kụwa egwu, mana ọ bụ n'afọ 2007 ka ọ chakere n'ihi na ọ daghị mba n'ọrụ. N'ọnụ ya, ""Ihe ọbụla onye na-eme, ya mepagide ya, otu ubọchị ọ ga-akwụta ụgwọ. ""Ọbụladị mmiri na-atụ pem pem, ọ ga-atụgide otu ahụ tụpuo ala kọnkịrị"". Maka Biafra: Nwa Aba kwuru na Biafra ga-amagbu onwe ya ma ọ bụrụ na enweta ya n'udo. Mana ọ gaghị abụ ihe ọgụ na mgba. O kwuru sị, ""Biafra bụ ihe ziri ezi. Anyị nweta Biafra ọ ga-adị mma, mana ọ bụ usoro e ji agbaso ya ka a ga-eleba anya. ""A ga-achọ etu ndị okenye ga-esi nọrọ ala kpaa ya iji nweta ya n'ụdị udo"". Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48961686 +health Eji m N5,000 azụta ikuku 'oxygen' kwa ụbọchị - nwaanyị na-enweghi ike iku ume "Ị gwa mmadụ na o nwere onye dị ndụ na-azụta ume ọ na-eku, ụfọdụ agaghị ekwe. Mana ọ bụ ihe otu nwaanyị achọghị ka a kpọọ ya aha a ma dịka ""Nwachukwu"" na-agabiga. Mgbe BBC gara gbaa ya ajụjụ ọnụ gbasara ọnọdụ ya, o ji anya mmiri na obi mgbawa kwuo sị ""Chineke nyere m aka gabiga ọnwụnwa a"" I lee ya anya n'ahụ ị ga-ahụ na akpụkpa ahụ ya na-eji oji mana ihu ya na-acha ọcha, ị ga-anụkwa mkpọtụ igwe nkutu ụme nke o ji eku ume. Ọ bụ mgbe ọrịa rịara m ka ndị dọkịta gwara m zụta nke ya bụ igwe nkutu ụme maọbụrụ na m chọọ ịdị ndụ. Ọ zụrụ nke mbụ N650,000 mana a na-edozi ya ugbua. Ọ zụrụ nke abụọ bụ N350,000. Ọ zụkwara nke ejighi ọkụ latrịk arụ ọrụ bụ N65,000 ma jiri kwa N15,000 zụta 'oxygen'. Ọ zụkwara nke a na-akwọ n'azụ ka nwa ọhụrụ bụ N200,000 maka mgbe ọ ga-eji chọọ ịpụ apụ. ""E nwere m dọkịta anọ na-agwọ m ọrịa a, a na m emefu N70,000 kwa ọnwa. ""Aha ọrịa m na-arịa bụ Pulmonary hypertension, nke na-eme ka ọbara ghara ịrụ mkpụrụ obi ka o si kwesi"" ka Nigerian Goddess kọwara. Ọrịa ahụ malitere ị rịa ya mgbe ọ dị naanị afọ atọ ""akpụkpa ahụ m bu ụzọ gbajie oji tupu e mee nyocha chọpụta aha ọrịa ọ bụ"" ka o kwukwara. ""Ụfọdụ ndị dọkịnta gwara m na enwere m ike ịgbake n'ọrịa a mana ụfọdụ gwakwara m na m ga-aṅugide ọgwụ rue ọnwụ m."" Nwaanyị a kọwara na di ya chụrụ ya na ụmụ ise ya maka ọrịa a. O kwukwara na ọ dịghịrị ya mfe ị kwụrụ ha ụgwọ akwụkwọ, nye ha nri nakwa kwụọ ụgwọ ụlọ n'ihi ọrịa. ""Onye nwe ụlọ ezitela ozi sị m kwụọ ya ụgwọ ụlọ nke afọ mana amaghị m ebe m ga-esi nweta ego ahụ."" Gụnyere n'ịzụta ume ọ na-ekwu kwa ụbọchị, ọ na-aṅụkwa ọgwụ ruru mkpụrụ ise kwa ụbọchị nke ụfọdụ n'ime ya ruru N4,000." https://www.bbc.com/igbo/afirika-54307626 +health Elephantiasis: Lee etu anwụnta nwere ike isi butere gị 'ụkwụ aba shoe' Ọrịa Elephantịasis nke a na-akpọkwa 'Lymphatic Filariasis' bụ otu ọrịa na-enye nsogbu na mpaghara Afrịka nakwa Asia. Ndị mmadụ na-eche na ọrịa bụ ọgwụ a gwọrọ agwọ na-ebute ya, mana nnyocha sayensị gosiri na ọ bụ nje a kpọrọ 'Nematodes' na-akpata ya. Nje ndị a bụ 'Nematodes' bụkwa anwụnta na-ekesa ha si n'ahụ otu onye feere onye ọzọ. Mana e nwekwara ụdị ọrịa ụkwụ ọzịza ọzọ a na-akpọ 'podoconiosis' A naghị ahụkarị ụdị nke a kwadaa, kama ihe na-akpata ya abụghị anwụnta. Ọ bụ ihe ọnatarachi dị n'ime ala, nke Bekee na-akpọ 'minerals' na-akpata ya. Mana ọ bụghị nke a ka akụkọ a na-ekwu maka ya. Gịnị bụ Lymphatic filariasis (Elephantiasis) N'ala Igbo, ihe a na-akpọ ọrịa a bụ 'ụkwụ aba shoe', maka na ọ na-eme ka ụkwụ mmadụ zaa azaa. Dịka anyị kọwara na mbụ, ndị mmadụ na-eche na ọ bụ ọgwụ a gwọrọ agwọ na-akpata nke a, mana nnyocha sayensị kọwara na ọ bụghị eziokwu Ọ bụghị anwụnta na-akpata ọrịa 'Elephantiasis' kpọmkwem, kama anwụnta na-ekesa nje na-akpata ya si n'ahụ otu onye feere onye ọzọ. Ụdị nje na-akpata ọrịa 'Lymphatic filariasis' maọbụ Elephantiasis' bụ nke Bekee kpọrọ 'Nematode Worms' maọbụ 'filariae'. Dịka ngalaba WHO si depụta, ụdị anwụnta na-ekesa nje a na mpaghara Afrịka bụ ụdị nke a kpọrọ 'Culex' nakwa 'Anopheles'. Ọ bụrụ na anwụnta a taa onye nwere nje a, ha nwere ike ibufe ya n'ahụ onye ọzọ. Nje a ga-anọzi n'ime ahụ onye ahụ na-abawanye, bịa nọchie ohere ebe mmiri si apụ n'ahụ mmadụ. Nke a ga-eme ka akụkụ ahụ a malite ịza aza. Nnyocha WHO gosiri na ọrịa a na-emetụta ihe ruru mmadụ nde iri atọ na isii (36 million) n'akụkụ ụwa niile, mana ọ ka njọ na mpaghara Afrịka nakwa Asia. Dịka nnyocha nke ngalaba ahụike nke ụlọakwụkwọ 'Stanford University' si gosi, ọrịa 'Elephantiasis' maọbụ 'Lymphatic Filariasis' enweghị ọgwụgwọ ga-eme ka ọ laa kpamkpam. Kama e nwere ọgwụ dị icheiche nke ga-eme ka nje ahụ na-akpata ya ghara ị na-abawanye n'ime ọbara mmadụ. Ọ bụrụ na nje ahụ anaghị amụba, akụkụ ahụ onye ahụ zara aza agaghị na-azawanye. Ọ dịkwa mkpa ka e gbochie anwụnta ịta onye dị nwere ya bụ ọrịa, ka ọ ghara ịtanyekwa nje ọzọ n'ahụ ya. Ihe onye nwere ọrịa a ga na-eme bụ: Dịka ọrịa, 'Elephantiasis', ọtụtụ ọrịa nke anwụnta na-ekesa, enweghị ọgwụ na-agwọta ha kpọmkwem, kama ọgwụgwọ onye ahụ ga na-enweta bụ a gba ekpere chi. Ya mere o ji dị mkpa ka i zeere anwụnta ma chụọ ya ọsọ ụkwụeruala n'okirikiri gị. Ọrịa ọjọọ ndị ọzọ anwụnta na-ekesa gụnyere: Ọrịa amaghị aha ya malitere igbu ọtụtụ mmadụ na mpaghara ụfọdụ n'Enugwu nakwa Delta steeti n'ọdị nso a, mana nnyocha mechara gosi na orịa ahụ bụ ịba ọchananya nke Bekee kpọrọ 'Yellow Fever'. Ọ bụ ụdị anwụ nta a kpọrọ 'Aedes' nakwa 'Haemogogus' na-ekesa ya bụ ọrịa. Kọmishọna Ahụike nke Enugwu steeti, bụ Emmanuel Obi, kọwaara BBC Igbo na ụdị anwụnta a bụ ndị na-efegharị n'oge ehihie. Nnyocha WHO mere gosiri na ọrịa na-egbu ọkara ndị niile butere ya kwa afọ. Ọ ga-ewe ihe dịka abalị atọ ruo abalị isii tupu ọrịa a amalite ịkpa ike n'ahụ onye butere ya, ọ bụrụ na-akpachaghị anya nke ọma, onye ahụ ga-anwụ ma ọ gachaa ihe dịka abalị asaa maọbụ abalị iri. Ọrịa 'yellow fever' na-akpa ike na mba iri anọ na asaa (47) na mpaghara Afrịka nakwa South Amerịka. Onwebeghị ọgwụ e ji agwọ ya kpọmkwem, mana ọ bụrụ na a chọpụta ya n'oge, ndịọrụ ahụike ga na-eleta onye ahụ anya ruo mgbe ọrịa a jiri aka ya laa. Mana oziọma dị na ya bụ na 'Yellow Fever' nwere ọgwụ mgbochi, onye ọbụla gbara ya agaghị arịakwa ya bụ ọrịa ọzọ. Na Naịjirịa, ọ bụrụ na ịgbabeghị ọgwụ mgbochi 'Yellow Fever', ị gaghị enwe ike ime njem gaa mba ọzọ. Ọ bụ n'ahụ Enwe ka a chọpụtara nje a bụ 'Zika' n'afọ 1947 na mba Uganda, mana n'afọ 1952 ka a hụrụ ya n'ahụ mmadụ na Uganda nakwa Tanzania. Ụdị anwụnta na-ekesa nje a bụ nke a kpọrọ Aedes. Mana nwaanyị nwere ike ibufe ya nwa o bu n'afọ, mmadụ nwekwara ike ibute ya site na mmekọ nwoke na nwaanyị. Ọrịa a anaghị emere ụmụnwaanyị dị ime ebere maka na ọ na-eme ka isi nwa amụrụ ọhụrụ pee ezigbo mpe, nke Bekee na-akpọ 'Microcephaly'. 'Zika virus' fesara na mba Brazil n'afọ 2015. Ọrịa a na-emetụtakwa ndị mmadụ ruo taa, mana ọnụọgụgụ ndị ọ na-emetụta pere mpe. Ọrịa ndị ọzọ anwụnta nwere ike ibunye mmadụ gụnyere: https://www.bbc.com/igbo/afirika-55389928 +sports Manchester United vs Newcastle: C Ronaldo egosila na ọ ka bụ odogwu n'egwu ọ ma agba Afọ bọọlụ nke 2021/2022 ga-abụkwa ọkpọka dịka mmadụ abụọ a bụ Cristiano Ronaldo na Romelu Lukaku gosiri ihe ha nwere ike imwenwu. Ronaldo nyere goolu abụọ dịka Manchester United ji ọkpụ goolu anọ a satara otu merie Newcastle. Mana Lukaku nyekwara goolu abụọ nke ya oge Chlsea gbara ndị Aston Villa 3-0. Ronaldo bụ aha a kpụ n'ọnụ n'ụwa niile kamgbe o si Juventus laghachi Manchester United. Ọtụtụ ndị ma anya egwuregwu bọọlụ ekwuola na o nwere ike inyere Man Utd aka bute iko EPL nke afọ 2022. Mana n'asọmpi ndị Man Utd na ndị Newcastle n'ehihie Satọdee aka Roinaldo gosiri na onye a na-ekwu nwere ihe ọ na-eme. Man Utd ji ọkpụ goolu anọ a satara otu merie Newcastle, ebe C Ronaldo nyere abụọ n'ime ha. Matakwa na nke a bụ asọmpi izizi ọ na-agbara Man Utd kamgbe ọ lọghachiri azụ. Bruno Fernandez na Jesse Lingard nyeziri abụọ ndị ọzọ. Chelsea wepụtara ego gbara ọkpụrụkpụ (£97.5 million) iji si n'otu Inter Milan zụta Lukaku n'afọ a. Cheta na Lukaku nyeere ndị Inter Milanaka mabute iko bọọlụ nke mba Itali nke afọ 2020/2021. Nke a bụ asọmpi mbụ Lukaku na-agbara Chelsea n'ama egwuregwu Stamford Bridge kamgbe a zụtara ya ọzọ. O nyebuola goolu abụọ tupu taa. Dịka ndị ọgba bọọlụ, Ronaldo na Lukaku yiri onwe ha n'ụzọ dị icheiche: Mana otu ndịiche doro anya bụ na Ronaldo ka Lukaku bụrụ okenye. Ronaldo dị afọ iri atọ na isii (36), ebe Lukaku dị afọ iri abụọ na asatọ (28). Ọtụtụ na-ekwu na ike agwụwala Ronaldo, mana ihe ọ gbara taa egosila na agadi anaghị aka nka n'egwu ọ ma agba. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-58531556 +health Causes of blindness: 'ịkpa oke megide anyị n'ihi ahụghị ụzọ gbochiri anyị inweta ọrụ' "Maxwell Opara gụchara mahadum tiwaa 'slate' mana ọ rara ya ahụ inweta ọrụ n'ihi na a na-akpagide ya oke n'ihi na ọ naghị ahụ ụzọ. Opara nwere asambodo 'First Class' na ngalaba 'mgbasaozi 'Mass Communication' na mahadum 'University of Nigeria Nsukka.' ""Abụ m onye ọkaibe na klassị anyị oge m gụchara na mahadum."" "" Ihe nọ n'obi m bụ na m gụcha, ụlọakwụkwọ anyị, enye m ọrụ, mana ọ dịghị otu a."" "" Mana ndị na-ewe n'ọrụ anaghị ahụ dịka onye ga-arụnwu ya"" E jighị nsogbu anya mụọ Maxwell. Ọ kọwara na nsogbu anya ya bidoro n'afọ 2012, mgbe ọ nọ na mahadum nke Federal University of Technology - Owerri (Futo). Nsogbu ahụ mere ka ọ kwụsị ịga ụlọakwụkwọ mgbe ahụ, n'agbanyeghi na ọ nọ na-achọ ịbanye n'afọ nke atọ ya (3rd year). O mechara legharịa ule e ji abanye mahadum ma banyekwa na nke 'University of Nigeria Nsukka' (UNN) ebe ọ nọ gụchaa n'afọ 2019. Demola Adeleke na Mercy Nwaigwe N'agbanyeghị na ha mere ọfụma n'ụzọ pụrụiche na mahadum, otu ihe nagidere ha inweta ọrụ; ịkpa oke megide ha n'isi ha kpuru. Opara, Adeleke na Nwaigwe gwara BBC Igbo na ha ekpughi isi mgbe a mụrụ ha. Ha kọwakwara ihe ha gabigara na etu ha siri gbasie mbọ ike n'agụmakwụkwọ ha ma turu ugo lọta. Opara gụchara jiri 'first class' pụta na mahadum, o che na ọ ga-enweta ọrụ na mahadum ahụ ọ gụrụ, mana nke ahụ enweghi isi. Nwaigwe kwuru etu o si gaa ịchọ ọrụ, lechaa ule so ya mana ha eweghi ya n'ọrụ mgbe ha chọpụtara na ọ naghị ahụ ụzọ. O kwuru na ọ chọpụtara na anya na-enye ya nsogbu mgbe ọ nọ n'ụlọakwụkwọ sekọndrị. Ọ kọwara etu o si mechaa banye n'ụlọakwụkwọ Federal College of Education dị n'Oyo steeti, bụ maka ndị ọpụrụiche, ma mechakwaa gaa mahadum nke University of Lagos, site n'afọ 2014 ruo 2017. Adeleke kọwara etu o si nweta CGPA 4.4 na mahadum mana ọ rara ya ahụ inweta ọrụ n'ihi na ""anaghị ewe ndị dị ka m n'ọrụ"". Dịka nchọpụta nke akwụkwọ mgbasaozi sayensi bụ 'Investigative Ophthalmology &Visual Science' si kwuo, ihe karịrị mmadụ nde anọ na ụma iri abụọ na ise(4.25m) dị agbata afọ 40 bụ ndị kpuru isi. Ọtụtụ n'ime ha na-agabi ịkpa oke dị iche iche nakwa nsogbu itinye ha n'uch oge a na-arụ arụmarrụ obodo iji nnyere ndụ ha aka. Gee ihe ha kwuru n'uju:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-61166556 +health Coronavirus Myths: I nwereike ibute coronavirus site na ahụrụ? "Dịka ọria coronavirus na-akpa ike na-aga n'ihu na Naijiria na mbaụwa, kepukepu ọhụrụ na-efegharị ugbua bụ na e nwere ike ibute ọria ọjọọ a site n'ahụrụ. Mana ndị ọkachamara ahụike gwara BBC lgbo na mkpụrụ adịghị n'ụkwa a ndị na-efesa ya bụ akụkọ na-apị. Kemgbe ọrịa coronavirus pụtara mbụ na Chaịna n'afọ 2019 ruo ugbua, ọria a nke ndị ọkachamara kwuru na a na-ebute site n'ụkwara maọbụ uzere, ataala isi otu ijeri mmadụ na ụma n'ụwa nile. Aka nile dị n'ọbọ ime nchọpụta maka ya bụ ọrịa, ọkachasị ọgwụ mgbochi na ọgwụgwọ nakwa etu ọrịa si ekesa. Otu ndọrịtaụka ọhụrụ pụtara n'ịntanetị bụ nkwenye ụfọdụ na mmadụ nwere ike ikuru coronavirus n'ahụrụ onye bu ọrịa a nyụrụ ọkachasị onye eyighị ọbante. Ọkachamara n'ihe gbasara nje nke Bekee kpọrọ 'virologist' bụ Ọkammụta Oyemade Tomori sị na, ""onye na-ekwu ụdị okwu a na-ama njakịrị."" O kwuru na ""e nwere ike ịhụ nje a na ngụgụ nakwa akụkụ ndị ọzọ e ji eku ume."" Dọkịta ahụike ọha na 'Lagos University Teaching Hospital' (LUTH), Dkta Bayo Onajole nakwa odeakwụkwọ otu jikọrọ ndị sayentist (Nigeria Academy of Science) bụ Dkta Doyin Odubanjo tinyekwara ọnụ n'ihe Tomori kwuru. Onajole sị na, ""ọ bụghị eziokwu"", ebe Odubanjo si na""anụbeghị m ya mbụ"". Mana Odubanjo na Tomori kwuru na nchọpụta gosiri na nje coronavirus nwere ike ịdị na nsị onye bu ya. Tomori, onye bubu onyeisi NASS sị, ""N'ezie, e nwere ike ịhụ ya na nsị."" N'otu aka ahụ, Dkta Odubanjo si, ""nchọpụta na-ekwu na-enwere ike ibute ya na nsị onye bu nje ahụ ọbụladị ma nnyocha kwuo na ọ gbakela"". ""Ya mere o ji dị mkpa ịkwọ aka ọfụma ma ị gachaa ụlọmposi."" Mana Onajole ekwetaghị na e nwere ike ibute nje coronavirus na nsi. O kwuru na coronavirus bụ ""ọrịa ọwa e si eku ume, (gastro-intestinal tract), ọ bụghị ọrịa nsi nke bụ nsi na nsị na ọnụ (fecal-oral)""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52286924 +sports Ghana vs Cameroon: Thomas Agyepong agaghị eso na asọmpi nke taa "Onyendu ndị otu egwu bọọlụ Black Stars nke Ghana bu Andre Ayew nakwa Thomas Agyepong esoghị na njikere ndị otu ha nwere iji kwadoo maka asọmpi ha na Cameroon taa. Ndị na-elekọta ha kọwara na ahụ esichaghị Agyepong ike iso gbaa asọmpị ha na Cameroon, ebe a na-ele anya na Dede Ayew nwere ike i so gbaa ya bụ asọmpi. Onye mgbasa ozi na ọnụ n'ekwuchitere ndi Black Stars bụ Dan Kwaku Yeboah kwuru sị na ""Ndị nlekọta ahụike otu Black starts si na ha ka na atule ahuisiike Dede nke ha ga-eji mara ma ọ ga eso na asọmpi nke taa."" Ayew na Agyepong merụrụ ahụ na asọmpi izizi nke dị n'etiti Ghana na Benin Republic mgbe mba abụọ ahụ gbara onwe ha 2-2. Ihe onyonyo na-egosi na Andre Ayew nọ n'oche ka ndị otu ya na-eme njikere ụnyaahụ. N'aka nke ọzọ, ndị otu egwu bọọlụ 'Indomitable Lions' nke Cameroun bụ ndị nke mbụ n'otu ""Group F"" dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ merie Guinea Bissau na asọmpi izizi ha. Cameroun, bụ ndị buru iko AFCON n'afọ 2017, na-ele anya imeri Ghana taa iji wee gafee n'agba nke abụọ. Aka na-achịkọta otu egwu bọọlụ Cameroon bụ Clarence Seedorf kwuru na ha ga-agbali imeri Ghana ma gakwaa n'ihu buo iko AFCON ọzọ n'afọ a. Asọmpi Ghana na Cameroon ga-ebiri ọkụ n'elekere isii nke uhuruchi taa, Satọde abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Juun 2019. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48797816 +sports Mikel Obi: Kedụ ihe m bịara ime ma ọbụghị ibu Iko AFCON "Mikel Obi ga-edu ndị otu Super Eagles nke Naịjirịa gaa mba Ijipt maka asọmpi Iko mba Afịrịka akpọrọ AFCON 2019 ekwuola na ọ bịaghi igwu egwu n'ihi na imeri ma buru kwa iko AFCON na-agusi ya ike. O ruola afọ isii Mikel Obi metụrụ Iko Mba Afịrịka aka. Mgbe ahu bụ mgbe Naịjirịa meriri na mba Saụt Afịrịka. Mgbe ọzọ Mikel gbata ihe n'Afịrịka bụ n'afọ 2006 na 2010 bụ mgbe otu Super Eagles gbatara ndị nke atọ. N'oge AFCON a, Mikel ga-edu ndị ụmụ okorobia ọbara ha dị ọkụ were sọọ asụmụpị nke afọ a na Ijipt. Mikel kwuru: ""N'agbanyeghi na ndị otu Eagles nke ugbua abụghị ndị aka ochie n'izute mba Afịrịka ndị ọzọ ka ya, asụmpị a ga-enye ndị dị ka Samuel (chukwueze) na Paul (Onuachu) ohere igosiputa nka ha. Enwekwara m olileanya na anyị ga aga ijiptu ma tụrụ ugo lọta."" O kwukwara n'obi dị ya ụtọ etu ndị Super Eagles siri agba mbọ n'agbanyeghi ọnyụpa ha dara n'asụmpị Iko Mba Uwa. Mikel kwetere na asụmpị a ga-esi ike mana o kwenyere na nka na nkwado ụmụ Super Eagles ga enyere ha aka imeri asụmpi a. Chetakwa na Mikel Obi gbaara Naịjịria bọọlụ nke mbụ n'afọ 2005 mgbe Super Eagles na otu egwuregwu mba Libya zutere. Mikel kwuru n'asọmpị a nwere ike ị bụ nke ikpeazu ya n'uwe Super Eagles. Ọ sị; ""otu ọbula ọ dị aga m agbalị ka ọ di nma.""" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48646225 +politics Gọọmenti Uzodinma sị azụ ụlọ mịbata ahịrị iwu a na-ese okwu - Frank Ugboma "Onye omeiwu na-anọchịte Oguta n'Ụlọomeiwu Imo steeti n'aha otu PDP bụ Frank Ugboma aghọọla aka na ụkwụ ya n'ebubo na ọ bụ ya wepụtara iwu ọhụrụ nyere gọvanọ Imo state ikike ịnwụchị onye sọrọ ya mgbe ọ sọrọ ya si na ọ bụ ""aka Esau"" webatara ya. N'akwụkwọ mgbasaozi nke omeiwu ahụ binyere aka, o kwuru na ọ bụ ezie na ya wepụtara iwu mana o nweghị akụkụ n'ime iwu ya wepụtara nwere ebe o nyere gọvanọ ikike ijichi onye masiri ya mgbe ọ masịrị ya. "" Ihe a abụghị iwu m wepụtara ma kwado. "" "" Ọ sịrị, ""Iji doo onye ọ bụla anya, e wepụtara m iwu gbakọtara nwee akụkụ 372."" ""Etu na ebe e si megharịa ya nwee tinye akụkụ 484 bụ ihe mgbagwoju anya."" Ugboma, onye bụ onye ọkaiwu gara n'ihu kwuo sị na oge ya kesara ndị omeiwu ibe ya akwụkwọ iwu ya webatara, oge a gụrụ ya nke mbụ na nke abụọ, n'akụkọ ahụ ' jọgburu onwe ya ma na-emekwa ihere bụ nke 484, adịghị ya. O kwukwara na o nweghị onye kpara maka ya bụ akụkụ na kọmiti e hiwere n'ụlọomeiwu Imo steeti. Ugboma kwuru na dịka ọkaiwu nakwa onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye, ""o nweghị ka ụdị iwu a lafere n'ọgbakọ ụlọomeiwu nke Itoolu m so na ya."" Ọ gara n'ihu kpokuo ndị ogbo ya ndị omeiwu ka ha nyocha ebe mmiri siri banye opi ụgbọgụrụ ma hazigharịa iwu ahụ. Onye ndụmọdụ onyeisi ndị omieiwu n'Imo steeti banyere mgbasa ozi bụ Emeka Ahaneku gwara BBC n'iwu na-ese okwu na steeti ahụ abụghị iwu ọhụrụ. Maazị Ahaneku sịrị na ọ bụ n'ọchịchị Emeka Ihedioha - bu onye ulọikpe ukwu na Naịjirịa chụtụrụ n'ọchịchị - ka iwu malitere njem. ""Ọ bụ omeiwu na-anọchịte Oguta bụ Frank Uboma wetere atụmatụ iwu a dịka n'usoro a na-akpọ ""Private Bill"" n'oge Ihedioha na-achị."" N'ime iwu a nke Gọvanọ Hope Uzodinmma tinyere aka na ya, o nwere ngalaba nyere gọvanọ ikike inwuchi onye ọbụla ọ chọrọ mgbe ọbụla, n'etu ọ bụ o si masị ya. Iwu ahụ nyekwara ya ikike idosa onye ahụ a nwuchiri n'ebe ọbụla maọbụ n'ọnọdụ ọbụla masịrị gọvanọ ahụ. Maazị Ahaneku sị na iwu a gara njem niile o nwereike ịga n'ụlọ omeiwu tupu e were ya nye kọmịti mmadụ itoolu nke gụnyere ndị ọkanmụta abụọ tupu e were ya nye gọvanọ ka o binye aka. N'ịza BBC azịza banyere iwu, ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Uzodinma bụ Uguwike Nwachukwu sị na ya amaghị ihe mere ndị mmadụ jiri kpụrụ onyeisi ya n'ọnu banyere iwu a. Nwachukwu sị: ""Amaghị m na Gọvanọ Hope Ụzọdịnma hibere iwu ọbụla bụ nke ""Executive"" n'ọnọdụ a dịka ụfọdụ ndị afọ ọjọọ na-ekwu. Iwu a na-ekwu okwu ya bụ nke onye omeiwu ji aka ya wepụta ma bụrụkwa nke ndị PDP nọ n'Ụlọ Omeiwu Imo kwadoro ọfụma n'oge ahụ."" O kwenyekwere n'ihe Ahaneku kwuru na ndị ọkanmụta n'ihe banyere iwu tinyere ọnụ n'iwu a. ""Ndị isi ha gbagotere n'iwu nyochara atụmatụ iwu a mana ajụghị ajụjụ banyere ọrụ ha rụrụ."" Ọ sịkwa: ""Iwu a abụghị iwu ọhụrụ. Ọ bụ iwu e si akara 401 na Criminal Procedure Law"" nke Naịjirị bịa.""Mana, nnyocha BBC gosiri na iwu ""Criminal Procedure Law"" bụ maka ndị a na-ahụ dịka ndị mpụ na nrụrụaka. Iwu a akpụ n'ọnụ ekwughi maka ndị mpụ na nrụrụaka. Uguwike sị na ""Ụzọdịnma, dịka onye bụbu onye omeiwu, ma maka iwu a na ihe ọ bụ karịa ndị ji ya eme ihe ndọrọndọrọ."" Ọ sị na ndị na-eche na iwu bụ nke eji emekpa ahụ ma na iwu a dị kemgbe ma bụrụkwa nke ọtụtụ steeti binyekwere aka. Oguwike sị na Uzodinma ma maka mmegide ikike dịrị onye nakwa usoro onye kwuo uche ya na mba dị ka Naịjirịa, nke mere ịsụ mma n'azụ banyere okwu agaghị akwụrụ. Ahaneku n'onwe ya sị na dịka Ụlọ Omeiwu Imo nọ n'ezumike ugbua, na ha ga-etinye anya n'iwu ma ha lagachite. Mbọ niile BBC gbara inwete Frank Uboma amịtaghị mkpụrụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-54202446 +sports AWCON 2018: Falcons anyụọ Bayana ịkpakwụ "Mmeri Super Falcons meriri otu Bayana Bayana nke South Africa emeela ka ha bute iko nke itolu (9) n'asompi AWCON. Ka nkeji 90 agbazuru bọọlụ, enyekwara ha nkeji iri na atọ ọzọ mana onweghị onye nyere goolu. Nke a mere ha jiri gbaa penariti bụ nke ndị Super Falcons ji gbajie ha aka napụ ha ya bụ iko ka ha nyere goolu anọ ebe South Africa nyere atọ. Nke a bụ ugboro 11 agbagoro egwuruegwu a. Naịjirịa jide itoolu ya ebe Equatorial Guinea ji abụọ ndị ọzọ. South Africa azọọla iko a na-agba nke ikpeazụ ugboro anọ na-achitaghị aja. N'ime ugboro anọ ahụ, ha na Naịjirịa agbaala ugboro abụọ bụ nke Naịjirịa merichara ha. Abịa n'otu ụmụnwaanyị gbara asọmpi nke 2018 a, ihe karịrị ọkara n'ime ha na-agba bọọlụ na mba ofesi, ebe ndị ọzọ na-agba bọọlụ na Naịjirịa. N'ime otu a sokwa gaa, a kpọrọ aha mmadụ anọ n'ime mmadụ 15 nwere ike inweta ihe nrite ""Nwaanyị kacha agba n'Afrịka"" nke 2018. Onye nchịkọta otu Falcons bụ Thomas Dennerby, sokwa na mmadụ ise nwere ike inweta ihe nrite ""Onye nkuzi kacha akuzi"" nke 2018. Ndị oche goolu 1) Tochukwu Oluehi Oluehi na-eyi uwe e dere 1, na-eche goolu na Rivers Angels dị na Rivas steeti na Naịjirịa. A mụrụ ya n'afọ 1987. 2) Christy Udogadi Ohiaeriaku Ohiaeriaku na-echere ndị Confluence Queens dị na Kogi steeti goolu. A mụrụ ya n'afọ 1996. 3) Chiamaka Cynthia Nnadozie Nnadozie na-echere ndị River Angels bọọlụ. A mụrụ ya n'afọ 2000. Ndị na-agba n'azụ 4) Onome Ebi Ebi na-eyi uwe e biri ise n'elu, na-agba bọọlụ na Henan Huishang dị na mba China. A mụrụ ya n'afọ 1983. 5) Osinachi Marvis Ohale Ohale na-eyi uwe e biri atọ n'elu, na-agba bọọlụ na Vaxjo DFF dị na mba Swidin. A mụrụ ya n'afọ 1991. 6) Glory Ogbonna Ogbonna na-agba bọọlụ na Ibom Angels dị n'Akwa Ibom steeti. A mụrụ ya n'afọ 1998. 7) Josephine Chukwunonye Chukwunonye na-agba bọọlụ na Asarums IF dị na mba Swidin. A mụrụ ya n'afọ 1992. 8) Ngozi Ebere Ebere na-agba bọọlụ na Barcelona FC dị na mba Spen. A mụrụ ya n'afọ 1991. 9) Faith Ikidi Michael Ikidi na-agba bọọlụ na Piteå IF dị na mba Swidin. A mụrụ ya n'afọ 1987. 10) Sarah Nnodim Nnodim na-agba bọọlụ na Nasarawa Amazons dị na Nasarawa steeti. A mụrụ ya n'afọ 1995. Ndị egwu etiti 11) Ngozi Okobi Okobi na-agba bọọlụ na Eskilstuna United dị na mba Swidin. A mụrụ ya n'afọ 1993. 12) Anam Imo Imo na-agba bọọlụ na Nasarawa Amazons dị na Nasarawa steeti. A mụrụ ya n'afọ 2000. 13) Halimatu Ayinde Ayinde na-agba bọọlụ na Asarum IF dị na mba Swidin. A mụrụ ya n'afọ 1995. 14) Rita Chikwelu Chikwelu na-agba bọọlụ na Kristianstand DFF dị na mba Swidin. A mụrụ ya n'afọ 1988. 15) Amarachi Okoronkwo Okoronkwo na-agba bọọlụ na Nasarawa Amazons dị na Nasarawa. A mụrụ ya n'afọ 1992. Ndị na-agba n'ihu 16) Asisat Oshoala Oshoala nwetara ihe nrite ""nwaanyị kacha agba n'Afrịka"" nke afọ 2017, ma bụrụkwa onye kacha gbakpuo bọọlụ na neetị n'Iko Mba Afrịka nke 2016. Ọ na-agba bọolụ na Dalian Quanjain FC dị na mba China. A mụrụ ya n'afọ 1994. 17) Desire Ugochi Oparanozie Oparanozie malitere ịgbara Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2010. O nwetara ihe nrite boot ọlaedo a na-enye onye kachasị nye goolu nke asọmpi AWCON e mere n'afọ 2014. Ọ na-agbara otu Guinamp dị na mba Frans bọọlụ. A mụrụ ya n'afọ 1993. 18) Francisca Ordega Ordega na-eyi uwe 17, na-agba bọọlụ na Washington Spirit dị na mba Amerịka, mana ezigara ya Atletico Madrid na mbinye. Ọ nọchitela anya Naịjirịa n'asọmpi ndị na-agafeghị afọ 17 nakwa nke ndị na-agafeghị afọ 20. O so Naịjirịa bulie iko atọ n'afọ 2010, 2014, 2016. A mụrụ ya n'afọ 1993. 19) Rasheedat Ajibade Ajibade na-agbara FC Robo dị na Legọs steeti bọọlụ. O nwetara ihe nrite ""onye kachasị gbaa ọfụma"" n'egwuregwu Naịjirịa na Kanada oge ha zutere n'asọmpi Iko Mbaụwa nke 2016. A mụrụ ya n'afọ 1999. 20) Chinwendu Vera Ihezuo Ihezuo na-agbara BIIK Kazygurt dị na mba Kazastan bọolụ. O nwetara ihe nrite ""onye kachasị gbaa ọfụma"" n'egwuregwu Naịjirịa na Spen oge ha zutere n'asọmpi Iko Mbaụwa nke 2016. A mụrụ ya n'afọ 1997. 21) Chinaza Uchendu Uchendu na-agbara ndị Sporting club de Braga dị na mba Pọtugal bọolụ. A mụrụ ya n'afọ 1997. Onye nchịkọta Thomas Dennerby malitere ịchịkọta otu Super Falcons n'ọnwa Jenụwarị nke 2018. Ọ bụbu onye nchịkọta otu egwu ụmụnwaanyị mba Swidin." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-46357103 +business Brexit: Ihe ga-eme dịka mba UK na-ahapụ Ọgbakọ Yurop Kpam Kpam na Jenụwarị 1, 2021 "Praịm Minista mba Briten bụ Boris Johnson ekwuola na njem mba ahụ nọ maka ịpụta ọgbakọ mba Yurop abịala na mmezu dịka ha na ndị na-anọchite anya Yurop bịara na nkwekọrịta maka atụmatụ Brexit. Nke a pụtara na Brexit ga-esu n'ụbọchị mbu nke ọnwa jenụwarị afọ 2021. Johson sị: ""na-agbanyeghị na anyị apụọla na otu European Union, Anyị na Yurop ka nọkọtara"". Johnson kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntakụkọ okwu ụbọchị tọzde. Okwu ya bịara dịka ịkasị ndị mmadụ obi dịka ọtụtụ na-atụ ụjọ ihe ọpụpụ a pụtara. Gọọmenti mba Briten kwuru sị ""anyị enwetakwala ikike n'elu ego anyị, iwu okeala, iwu obodo, azụmahịa nakwa mmiri a na-akpụ azụ"". Mba dị na Yorup dịka Jamini, Fransi ,Austria na ndị ọzọ akwadola ọpụpụ Briten pụrụ n'otu jikọrọ ha. O meela afọ anọ (site Juun afọ 2016) ụmụ afọ Briten tụrụ vootu were kwuo na ha chọrọ isi na otu ""European Union"" pụọ. Mana o ruola afọ 50 kemgbe ha kwenyere isu n'ọgbakọ Yurop nke mere ka ewepu oke ala mba niile nwere nkwekọrịta ị bụ otu ahịa nke Bekee kpọrọ ""EU Economic Zone"". N'oge ahụ, ọ bụ sọsọ Briten jidesiri ego aha aka dịka ndị ọzọ ji ego Euro gbanwe nke ha. Brexit a pụtara na ndị Briten abụghịzị ndị Ọgbakọ Yurop nke pụtara na oke ala ha abụghịzi ihe mmadu maọbụ ibu ga-agafe etu o si chọọ. Onye chọrọ isi Yurop gaa Briten maọbụ Briten gaa Yurop ga-ejizi akwụkwọ ikike. Tupu e binya aka n'akwụkwọ Brexit a, mmadu na ibu na ụgbọala na-abata ma na-apụ na-enweghi mbochi. Ndị Yurop agaghị a na-ebinwụ na Briten. Ndị Briten agaghị enwesi ikike ibi na Yurop n'enweghi akụkọ. Mba Nọten Ịland ka ga-anọ n'ihe a kpọrọ ""EU single market for good"". Briten na Yurop nwere nkwekọrịta iji hụ na oke ala Nọt ana Sawụt Ịland agbachighị agbachi. Nke a pụtara na ihe emepụtara na ịnland ka ga na-abanye Yurop na-enweghị mgbachi ọbụla. Ọ bụghị sọsọ azụmahịa nakwa nagharị mmadụ ka iwu a metụtara. Dịka nkwekọrịta eji hibe Ọgbakọ Yurop siri di, o metụtara njem ala n'ụgbọelu, atụmatụ ngbanwe eligwe a kpọrọ ""climate change"" nakwa mmekọrịta nchekwa. Ugbua, mmekọrịta siri welele ndị a niile ga-abịa na njedebe. Ọ ga-arịa ahụ inwete mmekọrịta ga-awa n'ihu karịa etu ọ dibu na mbụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-55440150 +politics Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Lee onye nwere ike ịchị APC Oshiomhole ọ ga-abụ onyeisi ọhụrụ otu APC? Tata ka otu pati na-achị Naịjirịa bụ APC ga-eme nzụko ukwu ha ga-eji ahọpụta onyeisi oche na ndị ndu ha N'ihu nhazi nzụkọ a, onye chịbụrụ Edo steeti bụ Adams Oshomole enwetara nkwado onyeisiala Buhari na onyeisi APC bụ Bola Tinibu ịbụ onyeisi oche. DSS ka nwuchiri Abaribe Onye omeiwu na-anọchịte anya Abịa Sawụtụ bụ Eyinnaya Abaribe na ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa ka nọkwa na-aka ndị DSS. Onwebeghi ihe asị na ọ bụ maka ya ka eji ejide omeiwu a, mana ndị PDP, na ohaneze ndị Igbo si na nke a ekwesịghị ime na ọchichi onye kwuo uche ya. Gụọ akụko a n'uju ebe a. Okwu Trump na Kim na-aga ọfụma Na mba ofesi, Mba Amerika ekwuola na ha ga-akwụsị emume nkwado agha ha na-eme na Sawụtụ Kọria. Ọnụ na-ekwuchitere mba Amerika n'ihe gbasara nchekwa obodo bụ James Mattis kwuru na ha were mkpebi a maka nkwekọrịta Amerika na Nọt Koria nwere n'ụbọchị ole na ole garaaga. N'egwuregwu iko mbaụwa Ụmụ Naijiria ka na anwụrịkwa maka mmeri Ahmed Musa nyere ha ụnyaahụ Mana egwu ka dikwa taa, ka Beljịọm ga-ezute Tunishia, ebe Saụt Koria ga-ezute Mekziko. Nke ikpeazụ ga-abụ nke Jamini na Swidin n'elekere asaa nke abalị taa. Gee akụkọ anyị Ihe nkiri nke tata bụ nke nwoke na esi ofe onugbu ọfụma. Kerie ya ebe a: https://www.bbc.com/igbo/afirika-44586002 +politics Nnamdi Kanu: Aka anyị adịghị na mkpọlata ya na Naịjirịa - Kenya "Mba Kenya agọrọla aka na ụkwụ ha na nnwuchi nakwa ịkpọnye Naịjirịa Nnamdi Kanu, bụ onyeisi otu na-achọ nwereonwe a kpọrọ indiginous People of Biafra (Ipob) bụ . Ọ bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na Kenya Bekee kpọrọ Kenyan High Commissioner bụ Wilfred Gisuka Machage kwuru nke a. Maazị Machage sị na akụkọ na aka Kenya dị n'ihe mere Nnamdi Kanu bụ ""asịrị gbakaa ute"". O kwuru ka ndị na-ebo Kenya ebubo a wete akaebe. Maazị Machage na-ekwu okwu dịka ọ na-asa ebubo nwanne Kanu boro na ọ bụ na Kenya ka a nọ nwuchie ya. Onye nnọchite anya Kenya a sị na mba ahụ agagh�� etinye aka maọbụ tinye anya n'ihe na-eme na Naịjirịa. Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Buhari mere ka BBC mata na ha achọghị ikwu mba a nọ nwuchie Maazị Kanu. Ọ sị na ihe ka mkpa bụ na aka ha akparala nwaamadị a gbara ọsọ kemgbe afọ 2017. Kenya bụ mba nke abụọ gọrọ agọ na aka ha adịghị n'ihe na-eme. Nke a na-abịa dịka mba UK gọchara n'aka ha adịghị na ya. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-57697570 +entertainment Igbo Culture: Ihe mere Igbo ji atụ Ikenga egwu "Ikenga bụ chi onye. Ọ bụ mmụọ ịkwụwa aka ọtọ, ike na ọganihu. Mụọ a bụ mụọ nwoke na ike dimkpa. Ikenga bụ atụrụatụ dịka ọ dị n'okpukerechi ndị ọzọ dị iche iche dị ụwa gbaa gburugburu site na okpukperechi ụka, Islam, Hinduism, Judaism na ndị ọzọ. Ndị a niile nwechere atụrụatụ ha na-elejere anya mgbe ha na-efe chukwu. N'omenala Igbo, a na-akpọ chi onye Ikenga. Ikenga bụ aka nri mmadụ, nke pụtara obi ọcha, ikwuwa aka ọtọ na eziokwu. Ihe eji anọchite anya Ikenga bụ atụrụatụ nwoke bu ihe n'isi ma jide ọdụ na oji n'aka abụọ. Mgbe ụfọdụ ọ na-ebu mma abụọ nwere nko n'isi. Mgbe ọzọ o burukwa atụrụatụ dịka isi ụmụanụ. Ọ dị mkpa ịmata na ọbụghị osisi niile ka e ji atụ Ikenga. Ndịgbo kwenyere na osisi ndị a nwere ike pụrụiche Chineke nyere ha o ji akpa ike. Ramas Okoyeasuzu, onyenlekọta omenala Igbo sị na ""osisi ndị a bụ Oji, ngwu na ogirisi"". Ikenga nwere ike nke mụọ oji arụ ọrụ maka ọbụghị Chukwu mana ọ bụ site na ya ka e si akpọkụ chụkwụ. Ramas kwuru na nwoke ọbụla wagoro akwa, nụrụ nwaanyi kwesiri ịnwe Ikenga. O kwukwara na ""Onye ya na Ikenga ya dị na mma, ihe na-agara ya werewere"". Nke a gosiri na ikenga mmadụ kwesiri ịna edu ya njem ma na-ewetere ya ihe ọma. Nchọcha anyị nwere na-egosi na-enwere ụdịrị Ikenga dị iche iche. Ikenga a bụ ụdị nke ana enye onye kpara ike n'obodo. Nke a na-abụkarị aturuatu mmadụ tukwu ọdụ nwere mpi na dịkwa egwu n'anya. Ọ na ejikwa ọdụ na obejiri n'aka abụọ. O na-ejikarị mma ahụ n'aka nri bụ nke akpọrọ aka Ikenga. Ọ bụ onye tozuru okorobịa na-enwe ikenga. Ikenga nke a na-adị nnukwu nwekwa atụrụatụ mmadụ na ụmụanụ n'ahụ ya. Ọ na-ejikarị ọdụ n'aka ekpe, jide oji maọbụ mkpọrọ n'aka nri ya. A na-egbukwa ya ichi n'ihu. Ọ na-ebu nnukwu ibu maka a na-edowe ya na obodo maọbụ ama ndị nwe ya. Otu onye anaghị enwe ya kama ọ bụ nke ọha. Nke a bụ Ikenga a na-enye ndị chiri echichi n'ala Igbo. Ndị chiri ọzọ na-ejikarị ya. Ikenga a gosiri ike na ọkwa pụrụiche. Mgbe ụfọdụ a na-ejikwa igwe akpụ ụdị Ikenga a. Ọ na-ejikarị ọdụ n'aka ekpe nke gosiri Ike na ọchịchị A na-erekwa Ikenga tupu amalite itinye ya n'ọrụ. Onye okenye n'ụmụnna chizuru echizu ka ọ bụ ọrụ ya ịmekwa Ikenga tupu e nye ya onye ọ bụ nke ya. A na-anọ n'ihu ọha maọbụ ụmụ nna mekwa ya bụ Ikenga. A na-eji ji, ọkụkọ, mmanya, ọjị na oseọjị achụrụ Ikenga aja izu ahụ. Enwekwara ike iri oriri ụbọchị ahụ dika aka ruru onwe nwe ya bụ Ikenga. Ya kpatara Igbo ji sị na Ikenga nwamgbenye na-atagbu onwe ya na ọjị. Onye nye Ikenga ezigbo ihe, ogbutere ya nnukwu anụ. Igbo sịkwa na Ikenga adighi ire awaa ya nkụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51837356 +politics "Elisabeth Ndubuisi Chukwu: ""Gọọmenti South Afirika gbachiri nkiti maka ọnwụ nwanne anyị""" Ezinụlọ Elizabeth Ndubuisi Chukwu nwuru na mba South Afirika na-akpọkụ gọọmenti etiti ka ha leba anya n'etu nwanne si nwụọ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48918947 +entertainment Etu Chinedu Bernard, Chima Precious ndị ejije Nollywood si laa mụọ "Anyammiri na akwa arịrị na-atụ n'etiti ndị ejije Nollywood na Naijiria taa dịka ndị otu ha abụọ; Chima Precious na Nwada Chinedu Bernard Nwankwo lara mmụọ n'okorobịa na agbọghọ na Fraide. Dịka onyeisi otu jịkọrọ ndị ejije Nollywood a kpọrọ Actors Guild of Nigeria (AGN) bụ Emeka Rollas, si gwa BBC Igbo n'ụtụtụ Satọde, Bernard bụ onye e ji ""Choco"" mara, gbabiri nwụọ n'Enugwu, ebe Precious nwụrụ n'Abuja ka ọ rịachara ahụ obere oge. Rollas sịrị, ""E nwetara m ozi na Chinedu Bernard gara ụlọụka ihicha ala n'ụlọụka St. Leo the Great Catholic Church dị na Federal Housing, Enugwu, daa nwụọ."" Rollas kwuru na ya enyela ntuziaka ka onyeisioche otu 'Actors Guild' n'Enugwu mee nchọpụta ka a mata etu o siri nwụọ (autọpsy) ka a mara ma ọ dara n'ala kụọ isi n'ala ka ọ na ọ bụghị etu ahụ. N'aka nke ọzọ, Rollas kwuru na Chima Precious dara obere ahụ, e buga ya n'ụlọọgwụ 'Kubwa Generel Hospịtal' mana ihe na-eme ya kawanyere njọ, e were gawa Gwagwalada General Hospital. ""Ka e buzi ya aga Gwagwalada General Hospital, ọ nwụọ n'ụzọ."" Rollas onye kọwara na ọ bụ ịba na taịfọd ka Precious rịarịa, gara n'ihu kwuo na ọ bụ naanị abalị abụọ ka ọ nọrọ n'ụlọọgwụ tupu ọ nwụọ. Ọ gara n'ihu dọọ ndị ejije aka na ntị ka ha gbalịa na-aga ụlọọgwụ mgbe ọbụla ha nwere nsogbu ahụike. Na nsonso a, ọnwụ ọnwụ na-afịọ na Nollywood dịka ụfọdụ n'ime ha a ma ama dịka Sam Obiago, Moses Ebere, Chinedu Nwadike, nwụrụla, ebe ụfọdụ dịka John Okafor, Kingsley Orji rịarịala ọrịa dowere ha n'agbata ọnwụ na ndụ tupu ha nwere onwe ha na nsonso a. Rollas kwuo na ya ehiwela komitii mmadụ atọ nke Ụkọchukwu Eucharia Anunobi nọ n'isi ya, maka ihaziri ndị otu ha ekpere megide ọnwụ erughị eru. Ihe ndị kwesịrị ị ma maka Chinedu Bernard Ihe ndị kwesịrị ị ma maka Chima Precious" https://www.bbc.com/igbo/afirika-61283220 +sports Man Utd agwala Tottenham na akpụkpọụkwụ nwere 'size' "Otu egwuregwu bọọlụ Manchester United edulaala Tottenham na asompi enyi na enyi ha gbara taa. Asọmpi a, a kpọrọ ""International Champions Cup"" n'asụsụ Bekee, bụ nke e ji akwado maka mmalite afọ ọhụrụ nke egwuregwu bọọlụ. Anthony Martial bu ụzọ gbakaa neetị na nkeji 21. Mana Lucas Moura mere garagara saa ya n'agba nke abụọ. Ka nkeji 80 na-akụrụ ọnụ, Angel Gomez nyere goolu ọzọ wee sị Tottenham taa kpuchie ọnụ. Mana obi gbawara ndị Manchester oge e bupuru onye otu ha bụ Eric Bailly maka ahụ o merụrụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49119397 +business Ngozi Okonjo-Iweala: Ihe ndị a ga-eme ka akụnaụba ala anyị ghara ịdakpọ n'ihi coronavirus Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka ego Bụ Ngozi Okonjo-Iweala tụnyere alo ihe a ga-eme iji gwalite akụnaụba Naijiria nke coronavirus kwadarala. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52572021 +health Safety at Home: Saa anya mmiri ka ihe iri ndị a dị n'ụlọ ghara ibutere gị na ezinaụlọ gị nsogbu ahụike "Ihe ụfọdụ dị n'ụlọ e ji egbo mkpa dị iche iche nwereike itinye mmadụ n'ihe mberede ga-ebute mmerụ ahụ maọbụ nsogbu ahụike nke Bekee kpọrọ ""domestic hazards"". Dịka Dkta Okon Akiba kọwara ya, 'domestic hazards' bụ ""ihe ọbụla nwereike imerụ mmadụ ahụ n'ụlọ"". Lee ụfọdụ n'ime ha nakwa ihe ndị dọkịta ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa gburugburu na ụlọọrụ nke Bekee kpọrọ 'Occupational and Environmental Physicians', kọwara maka ha, nakwa etu i nwereike isi gbalahu ọghọm ha nwereike ibute: Kamfọ bụ nzu Bekee ụfọdụ ndị mmadụ na-etinye n'igbe akwa ha maọbụ n'akụkụ ụlọ iji chụọ ụchịcha na ahụhụ ndị ọzọ ọsọ, nakwa ime ka akwa ha maọbụ ụlọ ha na-esi isi ọma. E ji ya arụ ọgwụ ụfọdụ, ọkachasị nke a na-ete n'obi maka oyi na ọtịta ahụhụ. Mana Dkta Abdulhakeem Abiola dọrọ aka na ntị kwuo na o nwere ike ibute ịba ọchananya. O nyere ndụmọdụ sị ""Ọ ka mma ka ndị mmadụ na-agba ọgwụ n'ụlọ ha na gburugburu (fumigation) mgbe ọbụla"". Ndị ọkachamara ahụike na websait WebMed kwuru na kamfọ nwere ike ibute ihe ọdịdọ, ọrịa imeju (liver disease) maọbụ ọnwụ ma mmadụ loo ya n'amaghị ama maọbụ o si n'akpụkpọ ahụ banye mmadụ ahụ. N'otu aka ahụ, Dkta Joseph Akinde bụ dịbia ahụike ụmụnwaanyị kọwara na kamfọ nwere ike ibute nsogbu na nwaanyị dị ime nakwa nke na-enye nwa ara. O nwere ike ime nwaanyị dị ime ọ mụọ nwa kga-eji nsogbu ahụike pụta ụwa. Ụfọdụ ndị ọgaranya na-arụ ọdọmmiri ogwugwu nke Bekee kpọrọ 'swimming pool' n'ụlọ ha iji na-enyere ndụ aka. Mana a kpachaghị anya, ya bụ ihe e ji ekpori ndụ nwere ike ibute ọnwụ. Dịka Dkt Abiola siri kọwaa, ọdachi ahụike nwere ike isi na nke a pụta bụ mmiri iri mmadụ maọbụ mmadụ ibute ọrịa na-efe efe. N'afọ 2018, nwa nwoke Daniel Oyebanjo bụ otiegwu Naijiria a ma ama dịka D'Banj, nwụrụ dịka ọ dakpuru n'ọdọmmiri ogwugwu ha nwere n'ụlọ ha. Dkta Okon Atiba nyere ndụmọdụ sị, ""Okenye amaghị egwu mmiri egwula mmiri naanị ya."" ""Ka onye nwere ọrịa na-efe efe, onye mmanya na-egbu, onye akwụkwụ maọbụ ihe ọdịdọ na-adọ (belusọ ọ gbakeela), ghara igwu mmiri."" Dkta Abiola sị na ọ dị mkpa onye na-azọ ndụ bụ 'Life guard' na Bekee ịnọ nso n'ọdọmmiri ogwugwu oge ọbụla onye amaghị egwu mmiri na-egwu mmiri. O kwukwara na ọ dị mkpa inwe 'life jacket' nso odommiri maka ndị amaghị egwu mmiri. Ọgwụ, ma nke mkpụrụ, ma nke mmiri nwere ike ibute ihe ndapụta ga-eduga mmadụ n'ụlọọgwụ maọbụ n'ala ili. Nke a ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ ṅụfee ole dọkịta gwara ya ṅụọ, maọbụ mmadụ ṅụọ ọgwụ mebigoro emebi. Kpachapụ anya, ma debe ọgwụ ebe aka nwata agaghị eru ya. Tufuo ọgwụ ọbụla oge ya gafegoro ka mmadụ ghara ị���ụ ya na-amaghị ama. Ihe ọzọ a na-ahụ n'ụlọ nwere ike ibute ihe mberede bụ batịrị nke na-enye redio, ụgbọala, elekere na igwe ndị ọzọ ọkụ. Ọ dị mkpa na e wezugara ya n'ebe aka ụmụaka agaghị eru ya. Dịka Dkta Abiola si kọwaa, itinye batịrị n'ọnụ maọbụ ilo ya elo nwereike ibute ihe Bekee kpọrọ 'Lead poisoning' dịka 'lead' maọbụ alkaline e jiri mee ya ihiwe ehiwe hiba n'mgbụrụ afọ nke nwere ike imerụ nwata nnukwu ahụ n'ime, bute ụkọ ọbara maọbụ ọnwụ. Ihe ọzọ dị mkpa bụ ịgba mbọ hụ na i debeghị batịrị na nso ọkụ, mmiri maọbụ tụnye ya n'ọkụ ma ọ nwụọ. 5. 'Bleach' na mmanụ ọkụ (kerosene) na kemịkal ndị ọzọ Ụfọdụ kemịkal ị na-edowe n'ụlọ maka igbo mkpa ụfọdụ dịka nke eji asụ akwa Bekee a kpọrọ 'Bleach', nke a na-atụnye na mmiri maka igbu nje (disinfectant), nwere ike ịghọ 'oduchiegbu' ma ọ bụrụ na ị kpachapụghị anya, ọ kachasị ma i nwee ụmụaka. Ụfọdụ okenye nwere ike amaghị ama buru mmiri kemical gbanye na nri maọbụ gbanye n'ọkụ nke nwere ike ibute ọdachị atụghị anya. Ụfọdụ agbaala ụlọ ọkụ maọbụ rie 'nsị' na-emerụ ahụ n'ihi ụdị ndajọ a. Otu ahụike mba ụwa WHO kwuru na ịna-ekuru kerosene oge ọbụla nwere ike ibute nsogbu mgbakasị arụ, ihe ọdịdọ, ajụ obubu, maọbụ ọnwụ. Dkta Abiola na-atụ alọ sị, ""Ekwela ka ọ dị ebe aka ụmụaka ga-eru ya."" ""Dee ha aha nke ọma ka mmadụ ghara iburu ha ṅụọ kpọọ ya ihe ọzọ."" Ndị dọkịta na-adụ ọdụ ka ị ghara ịgwakọ 'bleach' na 'ammonia'. Ha kwuru na ịgwakọ ha abụọ nwere ike iwepụta anwụrụ nke nwere ike imebi ihe n'ime ahụ gị ma i kuru ya. Kpachapụanya ebe ị na-atufu komkom kemical gwụrụ agwụ. Ihe ndapụta ọkụ latrik nwere ike isite n'ụdọ ọkụ ekpuchighị ekpuchi ọfụma maọbụ nke oke tara. Ọkụ ọgbụgba nwere ike ibute anwụrụ ikogbu mmadụ. Ọkụ nwekwara ike imerụ mmadụ ahụ maọbụ gbagbuo mmadụ maọbụ mee mmadụ iji ụjọ wutuo n'elu maọbụ gbaa ọzọ n'ụzọ nwere ike ibute nnukwu mmerụahụ maọbụ ọnwụ. Dkta Atiba kwuru sị, ""onye ọbụla kwesịrị inwee igwe mmenyụọkụ n'ụlọ, igwe mgbamaọkụ nkwa akwa mmenyụọkụ."" ""Gbanyụọ isi ebe ọkụ latrik ahụ si apụta ka 'oxygen' na-eme ka ọkụ ahụ na-enwu gbanyụọ."" ""Ejila mmiri emenyụọ ọkụ si na ọkụ latrik malite."" ""Ọkụ na-agba, were mmiri na-agbọ ụfọfụ menyụọ ya"" Abiola kwuru mkpa ọ dị ibeku ndị ụlọọrụ na-emenyụ ọkụ. ""Ezinaụlọ ọbụla kwesịrị inwe ekwentị ndị ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ."" 7. Ala na-amị amị na ọba nsaahụ (Bathtub) Ihe na-atọ ụtọ na-egbukwa egbu. Ọba asamahụ (bathtub) bụ ihe na-eneyere mmadụ aka ịsama ahụ n'ụzọ dị ụtọ mana o nwere ike ibutere mmadụ ọdachi ịgbajị ụkwụ, ukwu maọbụ kpụkpụ aka. Nwaanyị dị ime etiela afọ n'ala maka ịsa ahụ n'ime ọba asamahụ enweghị nchekwa ọbụla. Onye mmanya na-egbu maọbụ onye ahụ adịghị nwekwara ike ịda kụọ isi maọbụ akụkọ ndị ọzọ n'ala n'ihi ala ọmịmị. N'ihi ndị ndapụta dị otu a, Dkta Abiola, nyere ndụmọdụ sị, ""Gba mbọ tinye ute ụkwụ nwere eze n'ebe a na-asa ahụ."" ""Gba mbọ hụ na ịkwafughị mmiri n'ala . Ịkwafuo mmiri, i fichapụ ya ozigbo."" 8 . Ebu (mould) Dịka Dkta Abiola siri kọwaa, ebu dị na nri maọbụ na ebe ụfọdụ n'ụlọ nwere ike ibute nsi nri (food poisoning). Gbaa mbọ hụ na ebu anaghị eto n'ime ụlọ asamahụ gị. 9. Mma, ngaji na ngwa ndị ọzọ dị nkọ N'usekwu ka ihe mberede na-emekarị; ọ bụghị ọkụ, ọ bụrụ mmiri maọbụ ọ bụrụ ngwa ike e ji eme ihe dịka mma, ngajị na ihe ndị ọzọ e ji esi nri na ngwa ndị dị nkọ. Ihe ndị a nwere ike imerụ mmadụ ahụ maọbụ bute nsogbu ahụike. Dkta Akiba nyere ntuziaka ka ""i wezuga mma na ihe ndị ọzọ ga-emerụ mmadụ ahụ ebe aka ụmụaka agaghị eru ha"". 10.Igwe na-enye ọkụ Ọtụtụ ezinaụlọ ekpochapụla n'ihi ịdọba igwe na-enye ọkụ n'ebe ekwesịghị. N'afọ 2019, anwụrụ si n'igwe na-enye ọkụ kpochapụrụ ezinaụlọ mmadụ asaa; nne, nna na ụmụaka ise n'Ikwerre Rivas steeti. Dịka ndị ọkachamara si kọwaa, igwe na-enye ọkụ na-ewepụta anwụrụ nke nwere ikuku Bekee kpọrọ 'carbon monoxide'. Dọba igwe ọkụ gị ebe anwụrụ ya ga na-apụ apụ. Mmanụ 'petrol' a na-agbanye n'igwe ọkụ ekwesịghị ịdị n'ime ụlọ. Debe ya na mpụga ebe aka ụmụaka agaghị eru ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56461034 +entertainment Ebuka: Mụ na Prince William bụ enyi Ebuka Obi-Uchendu bụ onye na-eme ihe onyonyo amaama, gwara BBC Igbo ihe mere o jiri wuo ewu n'ụbọchị agbamakwụkwọ Harry na Meghan. Ọrụ si n'aka: Jessica Nwankwo https://www.bbc.com/igbo/media-44237556 +politics Akụkọ kachasị n'abalị a: Grace Mugabe chọrọ igbu m - Mnangagwa Akụkọ dị mkpa; Emmerson Mnangagwe ekwuola na Grace Mugabe chọrọ igbu ya. Onyeisiala mba Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa ekwuola na ọ bụ ndị otu nwunye onyeisi mba n'oge gara aga bụ Grace Mugabe chọrọ ị ji ogbunigwe gbagbuo ya. Cheta na mmadụ abụọ nwụrụ, ebe mmadụ iri anọ nwere mmerụ ahụ n'ogbunigwe gbara oge ọgbakọ ndọrọ ndọrọ n'ala ahụ. N'ihi ogbugbu ọtụtụ ndị mmadụ na Platu Steeti, onyeisiala bụ Mohammadu Buhari na ndị isi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki na Yakubu Dogara nwere mkparịta ụka ime ụlọ taa. Na mkparịta ụka ahụ, Buhari gwara ha na o bu n'obi ikpogharị ọrụ nchekwa na Naịjirịa. Ndị obodo Igbeagụ dị n'Ebonyi Steeti agbala ọsọ ndụ na-eleghi anya n'azụ maka nsogbu dị n'etiti ha na ndị Ukelle nke Kross Riva Steeti n'ịzọ oke ala. BBC Igbo chọpụtara na esemokwu ahụ bụ nke malitere kamgbe afọ 2015 atala isi mmadụ ruru narị atọ. N'egwurewgu: Mba Jamịnị bụ ndị ji bu Iko Mbaụwa agwakọrọla laa na nke afọ a dịka Saụt Korịa gbara ha ọkpụ abụọ asataghị otu N'aka nke ọzọ sweden gbara Mexico ọkpụ atọ mana mba abụọ ndị etozuola oke n'agba abụọ nke asọmpị a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-44632972 +health Coronavirus n'Afrịka: O meela ọnwa isii coronavirus batara Afrịka "Otu jikọrọ mba niile dị n'Afrịka bụ 'African Union' akpọọla oku ka onye ọbụla kee ajị n'ume dịka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus agafeela otu nde. Dịka ndị AU si kwuo, ọkara ndị niile bu ya bụ ọrịa n'Afrịka bụ na Saụt Afrịka. Ha kwukwara na ihe na-eme na Tanzania na-awa ha isi n'ihi na mba ahụ enweghị ezi ọnụọgụgụ maka ndị bu ya bụ ọrịa. Onyeisi ngalaba mgbochi ọrịa na-efe efe na AU bụ John Nkengasong kwuru sị: ""Anyị arịọla Tanzania ka ha nye anyị ezigbo ọnụọgụgụ maka ndị bu Covid-19 mana ha enyebeghị anyị ọsịsa ziri ezi."" Ndị ọkacha mara ekwuola na onweghi onye ma nke bụ eziokwu mmadụ ole bu coronavirus n'Afrịka n'ihi na ọnụọgụgụ ya ezuchaghị oke. Ihe karịrị puku mmadụ iri abụọ na abụọ anwụọla n'Afrịka niile n'ihi ọrịa coronavirus, ebe mmadụ 690,000 agbakeela. John Nkengasong kwuru na nnyocha Covid-19 e merela n'Afrịka agafeela nde asatọ, mana ọ bụrụ na ihe gara etu e si chee, o kwesila ịgafe nde 13. Ijipt bụ mba izizi coronavirus batara n'Afrịka n'ọnwa Febrụwarị 2020, dịka ọ gachara izuụka atọ ya bụ ọrịa banyere na Yurop. Ka ọ dị ugbua, Saụt Afrịka na Ijipt bụ mba abụọ ọrịa a kacha akpa ike n'Afrịka niile. Mana John Nkengasong gwara BBC na ụlọọrụ ya jikwa ọdụ anya ele mba ụfọdụ ebe ya bụ ọrịa ji nwayọ agbalite dịka Naịjirịa, Gana, Kenya, Etiopia, Sudan, Zambịa na Zimbabwe. Ndị ọkachamara etoola Afrịka maka mbọ ha gbara igbochi mfesa coronavirus, ọkachasị etu ha si kpọchie mba ha n'oge. Nke a kpatara na ndị bu coronavirus n'Afrịka dị nta karịa ndị nke Yurop (otu nde na ụma) nakwa ndị nke Amerịka (nde anọ na ụma). Mana ụfọdụ na-ekwu na o nwere ike ịbụ n'Afrịka anaghị eme nnyocha maka ọrịa a etu o kwesịrị. Nnyocha egosila na ọgwụ mgbochi nke e mepụtara na Mahadum Oxford dịka ọ na-arụ ọrụ. A gbara ụfọdụ ndị mmadụ ya bụ ọgwụ na Saụt Afrịka. Mana John Nkengasong na-ekwu na ihe ga-aka enye aka bụ ndị mmadụ iyi akwa mkpuchi imi Bekee kpọrọ 'facemask'. Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-53753691 +sports Tottenham vs Manchester City: Tottenham agbaala Manchester City ose n'anya "Asọmpi otu egwu bọọlụ Tottenham Hotspur na Manchester City bụ nke kpọtụrụ na mgbede a n'egwuruegwu Premịa Lig. Tottenham Hotspur ji ọkpụ goolu abụọ merie Manchester City. N'eziokwu, Manchester City agbanyeghị na ha nọ n'obi ndị Tottenham site ka ha sị gbaa ha bọọlụ. Na nkeji nke iri atọ na itoolu ka ndị Manchester City newtara penariti mana Ilkay Gundogan tara ya. Tottenham ezughi ike n'agba nke mbu ebe Manchester City chị ọkụ sodo ha ma gbata akwụkwọ ịdọ aka na nti atọ ebe Tottenham ji otu tupu ha alaa ezumike. Ka abatachara ezumike ka enyechere Olexandr Zinchenko mpempe akwụkwọ mmeemmee na nkeji 60"". Steven Bergwijn nke Tottenham ji otu ọkpụ zaa aha ya na nkeji 63 iji kasie Mourinho obi. Ọ dị ka nke ahụ ezughị, Son Heung-Min nwaafọ Saụt Koria tinyere Tottenham goolu nke abụọ na nkeji 71. Mmeri a mere ka ndị Hotspur gbagolite na ogogo nke ise ebe Manchester City ka gwunyere na ogogo nke abụọ ha nọbu. Ọnwụ Manchester City na-esi ịnapụ Liverpool ndị nke mbụ na Lig kpuru afọ n'ala n'izu a ebe Liverpool ka jicha ihe ruru akara 22 aga ha. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51350146 +politics Ugboro ole awakporola ndị nkwado pati dị iche iche n’akụkụ Naịjirịa Dịka ntuliaka 2023 ji ọsọ abịa, pati dị iche iche malitere achụmta vootu ha kemgbe ọnwa Sepụtemba mana kwa izuụka, a na-anụ akụkọ gbasara etu ndị ekperima na ndị agboro si awakpo ụfọdụ ndị nkwado pati dị icheiche. N'ọdị nso a ụdị mwakpo a dịka akụkọ si gosi, emetụtala ndị nkwado Labour Party, ebe ndị otu Peoples Democratic Party enyekwala mkpesa maka ya. Iji maa atụ, akụkọ pụtara na ngwụcha izu gara aga na ndị agbaro wakporo otu onye Labour Party ebe ọ na-amado akwụkwọ mgbasaozi pati ahụ n’okpuruọchịchị Atakunmosa dị n'Osun steeti ma were mma merụọ ya ahụ. Rabiu Ismaila bụ onue a sụrụ mma a, nọ n’ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ ugbua. Nke a na-abịakwa dịka ụfọdụ ndị nkwado pati ahụ n’akụkụ Owode, Igangan nakwa Olopon n’akụkụ Ọdịda anyanwụ Naịjirịa. Leekwa ebe ndị ọzọ akụkọ mwakpo dapụtarala megide ndị nkwado Labour Party Otu nwaamadị a ma ama na soshal media dịka Flagboy nakwa otu ogbo ya danyere n’aka ndị agboro bụ ndị wakporo ha oge ha na-ebugharị ọkọlọtọ Labour Party na mpaghara Oshodi, Legos steeti. Nke a mere n’ọnwa Ọktoba, 2022. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs bụ Benjamin Hundeyin, gbara ama nke a ma kwuo na ha ga-ama imi n’ala nyochapụta ndị mere ihe a ma nye ha ntaramahụhụ dịrị ha. E kwuru na ndị agboro ahụ tiri mmadụ abụọ a ihe ma chọọ imunye ha ọkụ tupu otu onye agha nọ nso ebe ahụ agbatara ha ọsọ enyemaka. Ndị ojiegbe wakporo ụlọ otu nwaanyị aha ya bụ Victoria Chintex n'ụbọchị Mọnde, Nọvemba 28, na Kaduna, ma were egbe gbagbuo ya n’ime ụlọ ya. Nwaanyị a bụ onyeisi ngalaba ụmụnwaanyị na Labour Party n'okpuru ọchịchị ya bụ Kaura na Kaduna steeti. Amabeghi ndị bụ ndị ojiegbe ahụ nakwa ihe bụ ebumnobi ha, mana onyonyo pụtara n'ịntanetị gosiri ebe nwaanyị ahụ na-agbasa ozi maka Labour Patị. Chetakwa na enweela ọtụtụ mwakpo ndị ojiegbe na mpaghara dị icheiche na Kaduna. Ọtụtụ na-arụ aka na ogbugbu Oriakụ Chintex bụ njịkọ ọrụ ya na otu Labour Party, mana ndị uweojii ekwubeghị kpọmkwem ihe kpatara ya. Ndị ojiegbe ahụ gbakwara di Victoria Chintex egbe, mana ọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua. Enugu steeti abụrụla steeti akụkọ mwakpo nakwa nkụsa ọgbakọ ndị otu Labour Party na-esikarị apụta. Akụkọ mwakpo dapụtara na steeti ahụ n’ọnwa Sepụtemba dịka e kwuru na ụmụ okorobịa wakporo otu ọgbakọ ndị Labour pati n’okpuruọchịchị Nkanu East. N'ọnwa Ọktoba, akụkọ ọzọ pụtakwara na ndị ojiegbe wakporo ndị Labour pati n’obodo Umuida, nke okpuruọchịchị Igbo-Eze North na steeti ahụ n’Ọktoba. Ndị ojiegbe a gbara egbe aghara aghara iji chụsaa ndị nọ n’ọgbakọ ahụ ma gbaa ọtụtụ ụgbọala nọ ebe ahụ ọkụ. Akụkụ Enugwu steeti ndị ọzọ ebe a wakporola ndị Labour Pati n'ọgbakọ ha gụnyere Aninri, Awgu nakwa Oji River. Na izu gara, onye ndụmọdụ gọọmentị etiti n’ihe gbasara nchekwa bụ Babagana Monguno dọrọ ndị gọvanọ steeti dị iche iche aka na ntị ma kwuo ka ha chee aka ghọrọ ya na ndị ọrụ nchekwa banyere atụmatụ iji ndị agboro akụsa achụmnta vootu ndị pati ọbụla na Naịjirịa. Monguno kwuru nke a iji saa okwu na ụfọdụ ndị gọvanọ na-ehibe usoro na-egbochi ndị patị ọzọ na-anọghị n’ọchịchị na steeti ime mgbasaozi nakwa achụmnta vootu na steeti ha. Omụmaatụ, akụkọ pụtara n'ọnwa Ọktoba 2022, etu ndị uweojii si were anwụrụ ose chụsaa ndị nkwado Labour pati na-eme ngagharị nkwado maka Peter Obi n'Abakiliki. Otu Labour Party katọrọ ụdị aka ike a ma kwuo na ọ bụ mmaja ka a na-amaja ndị nkwado ha, mana Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti kwuru na ọ bụ n'ihi nnupu isi kpatara ndị ọrụ nchekwa ji chụsaa ndị nkwado 'Labour Pati'. Ọ bụghị naanị Labour Party natarala mwakpo n’oge achụmnta vootu a. Akụkọ pụtara n’ọnwa Nọvemba na ụfọdị ndị ntorobịa wakporo Atiku Abubakar nke People’s Democratic Party (PDP) oge ọ gara njem ịchụ nta vootu na Maiduguri, Borno steeti. E kwukwara na ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ ahụ ebe a kụsara ọtụtụ ụgbọala ndị nọ ebe ahụ. Ndị uweojii katọrọ ihe a mere dịka ha kwuru na ha ehibela otu ga-ama imi n’ala nyochapụta ndị mere ya bụ mwakpo. Akụkọ ọzọ pụtakwara n’otu ọnwa ahụ na ndị agboro wakporo ndị nkwado PDP n’ọgbakọ ha n’okpuruọchịchị Omuma na Rivas steeti. E kwuru na a wakporo ndị a ebe ha na-amado akwụkwọ mgbasaozi Atiku Abubakar ebe ahụ. Chetakwa na ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) wepụtara iwu ga-achịkọta achụmnta vootu nke afọ na-abịa abịa. Otu n’ime iwu ha bụ na ndị pati ọbụla agaghị eji ndị agboro rụọ ọrụ achụmta vootu ọbụla n’akụkụ Naịjirịa. Ha bụpụtara ịda nha nakwa ntaramahụhụ ga-adịrị pati ọbụla e jidere na-eme nke a. https://www.bbc.com/igbo/articles/c51kj6pyry4o +politics Lee ka Kate Anorue siri napụ ndị ọcha ya bụ ọkwa wee gosi na nwanyi bụ ihe "Mayor Kate Anorue bụ onye Nanka dị n'Anambra Steeti meriri ndị ọcha nakwa ọtụtụ ụmụnwoke ya na ya zọrọ ochịchị n'Enfield ugboro abụọ. Ọ bu ụzọ chia site n'afọ 2012 rụo afọ 2013 mana ọ chiri nke ọma nke mere ka ahọpụtakwa ya ọzọ dịka onye ọchịchi Enfield ọzọ. Nanị ya bụ onyeisi ojii nke mbụ nọ n'oche ọchịchi a ugboro abụọ na mba Briten. Oriaku Kate hapụrụ Naijiria gaa obodo Britain n'afọ 1985. Ọ kọwara na nna ya kwesiri ike na nwaanyị ọbụla kwesiri igụ akwụkwọ dika umu nwoke nke mere na nna ya zụrụ ya na akwụkwọ nke ọma. Ndị obodo ya bụ Nanka Chiri ya ""Ada jere mba turu ugo "" n'afọ 2008. Ndị omeiwu Anambra Steeti kwanyere ya ugwu pụrụ iche site na ịmere ya nke bekee kpọrọ 'Valedictory Sitting' n'Awka. Lee ozi ekele ezitere Kate Anorue oge ahọpụtara ya dịka Mayor Enfield. Dịka Kaụnsul Enfield siri wepụta n'websait, Kate Anolue na ndị imeobi ya ga-anọ n'ọkwa ọchịchị ahụ afọ 2019/20. Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ ndị mmadụ na-ezi ozi ekele maka nturuugo ahụ. Otu APC na London kelere ya maka ibulie aha Naijiria elu n'ofesi nakwa maka ịbụ nwaanyị isi ojii mbụ a ga-eme 'Mayor' na mba Briten. @UchePOkoye sị na nwa afọ Anambra ọzọ etuterela Nigeria ugo na mba ofesi. 1. Anolue bụ nwafọ Nanka n'Anambra steeti 2. Ọ bụ onye ọkaiwu ma bụrụ onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị na ụmụaka 3. 'Ada Jere mba turu ugo' bụkwa onye 'midwife' nwetarala ọtụtụ nzere na Naijiria nakwa na mba ofesi 4. Anolue gara ebido ụwa ya dịka onye nkuzi mana Agha Biafra bụ ihe kwụsịrị ọzụzụ ya dịka onye nkuzi na Teachers Training College. 5. Ọ bụ onye anaghị ahụ mmanya ọkụ ma sorokwa n'otu ndị kweneyere na anaghị edetụ mmanya ọkụ ire bido oge ọ dị afọ 18 6. Anolue arụbuola dịka 'Mayor' of Enfield n'afọ 2012/13 Akụkọ ga-amasi gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48229762 +politics Nigeria Election 2023: PDP na APC aghasaala Naịjirịa - Chukwuemeka Ezeife "Dịka ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na-akpudebe nso, Chukwuemeka Ezeife, bụ aka chịburu Anambra steei, ekwuola na nzọpụta Naịjirịa agaghị esi n'aka otu 'Peoples Democratic Party' (PDP) maọbụ otu 'All Progressives Congress' (APC). Ezeife, onye e ji Ọkwadike mara, kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọdị nso a. O kwuru na APC na PDP egosila na ha abụọ bụ otu ihe; ""ha abụọ bụ babasị"". Okwadike kwuru nke a dịka kepukepu na-efegharị na ndị PDP emegheela ụzọ ha ka onye ọbụla si mpaghara ọbụla na Naịjirịa, nwere mmasị iso zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa, bịa tinye akwụkwọ. Cheta na a na-echebu na Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 nwere ike isi mpaghara Ndịda, n'ihi na Onyeisiala ugbua bụ Muhammadu Buhari si mpaghara Ugwu. Nke a bụ maka na pati abụọ kachasị na Naịjirịa bụ APC na PDP na-eyigharị mpaghara ebe ha na-esi ahọpụta ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa; a na-akpọ nke a 'zoning' na bekee. Nke a pụtara na ọkwa Onyeisiala gaara ndị Ugwu n'oge a, ọ ga-agara ndị Ndịda n'oge nke ọzọ. Otu APC ekwuola na ọ bụ na mpaghara Ndịda ka ha ga-esi ahọpụta onye ga-azọ ọkwa Onyeisiala na 2023. Mana PDP ekwubeghị nke ha kpọmkwem, kama akụkọ na-ekwu na ha ekwuola ka onye ọbụla nwere mmasị bịa soro zọọ. Okwadike kwuru na ihe a ndị PDP mere jọgburu onwe ya maka na o doro anya na ọ bụ ndị Igbo ka ọkwa Onyeisiala ruru na 2023. ""Naanị ọnwa isii ka onye Igbo nọrọla n'isi ọchịchị na Naịjirịa; ya bụ Aguiyi Ironsi n'oge ndị agha,"" o kwuru. ""Na nke ndị Yoruba, Obasanjo chịrị afọ atọ dịka onye agha, bịakwa chịa afọ asatọ dịka onye nkịtị."" ""Osinbajo bụkwa osote Onyeisiala ugbua, ọ ga-anọ ya afọ asatọ."" ""Ị gaa na South South, Jonathan chịrị afọ isii."" ""Etu e si eme ọchịchị Naịjirịa bụ onye wepụ ibe ya ewere, ndị Ugwu wepụ, ndị Ndịda ewere."" ""Ndị o ruuru ugbua bụ ndị Ndịda, abịa na Ndịda ahụ, ọ bụ ndị Igbo ka o ruru."" ""Kedụzi etu ọ ga-esi bụrụ ugbua o ruru ndị Igbo ka ndị PDP ga-asịzi onye gbata ya were?"" Okwadike kwuru na ihe nke a gosiri bụ na ""Chineke na-akwadoro anyị Naịjirịa ọhụrụ nke na-abụghị PDP maọbụ APC"". ""Chineke egosila anyị akara anyị ga-eji mara na otu abụọ a abụghị ya."" Okwadike gara n'ihu kwuo na ya nwere nkwenye siri ike na onye Igbo ga-ewere ọchịchị Naịjirịa n'afọ 2023. O kwukwara na ọ bụ mgbe onye Igbo ga-abụ Onyeisiala ka Naịjirịa ga-ahụ ihe dị iche na mmepe obodo. Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi, Nnamdi Agbanelo, na Chukwudi Okereke." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61139275 +entertainment Igbo Traditional marriage: Lee obodo e ji naanị naịra iri abụọ na ise alụ nwaanyị n'ịgbankwụ Ịlụ nwaanyị n'ala Igbo so n'emume kachasị oke mkpa. Ụfọdụ na-ahụta ya ka ihe dị omimi ma dịkwa oke ọnụ. Mana o were anya na ihe kachasị eri ego n'alụm nwaanyị n'ala Igbo bụ nri na mmanya a na-enye ndị ọgọ. Nke ahụ abụghị iwu, mana e kwesiri inye ndị bịara gị mmeme ihe oriri na ihe ọṅụṅụ dịka aka ha onye na-eme ihe. N'omenala Igbo, ụgwọ isi nwaanyị bụ ihe kachasị mkpa n'emume ịlụ nwaanyị. Ihe a na-akwụ n'isi nwaanyị dị iche iche dịka omenala ndị sị dị. N'Arochukwu ugwu isi nwaanyị bụ ọkwa isii, nke pụtara naịra iri abụọ na ise (N25.00). Mana ọ bụghị ya bụ naanị egọ a na-emefu n'ịlụ nwaanyị ebe ahụ. Ihe ndị ọzọ na-erikwa ego bụ ihe a na-enye ụmụnna na ndị ikwu na ibe. Ihe ndị a dịkwa iche iche dịka omenala ndị si dị. Mana ugbua, ndị ụfọdụ na-etinye ihe na-adibughị n'akwụkwọ omenala ndị obodo ha, ọkachasị ma ha hụ na onye chọrọ ịlụ nwa ha nwaanyị nwere ego. Arochukwu bụ obodo dị n'Abia Steeti, na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, ebe ndị ka n'ọnụgụgụ bụ ndị Igbo. Ọ bụ obodo a ma ama mgbe gboo n'ọdịnala nakwa ntọnala Igbo. Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ e ji mara arọ bụ arụsị ha a na-akpọ Ibini Ụkpabị. Ọ bụ arụsị a ka ndị bekee na-akpọ 'Long Juju'. N'ihi agha, ịgba ohu, ọrụ ugbo nakwa ihe ndị ọzọ, ọtụtụ ndị Arochukwu pụrụ gbasaa n'ala Igbo niile. Taa, na steeti dị icheiche n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, a ga ahụrịrị obodo ndị mgbọrọgwụ ha si n'Arochukwu. Ndị mere akụkọ a bụ Chukwudi Okereke na Nnamdị Agbanelo https://www.bbc.com/igbo/60002597 +business """Ọ bụ ebe 2:30 ụzụ ụtụtụ ka akpọrọ m na ahịa m na-agba ọkụ""" "Ọ bụ n'ụbọchị Monde ka ọkụ gbara n'ọtụtụ akụkụ ahịa Main Market dị n'Ọnịcha. BBC laghachiri n'ahịa ahụ ịgba ụfọdụ ndị ahịa ajụjụ gbasara etu ya bụ ọkụ sị metụta ha. Otu onye n'ime ndị gwara onye ntaakụkọ anyị okwu aha ya bụ Samson Odiagu kọrọ etu e si kpọọ ya n'ekwentị na ụlọahịa ya na-agba ọkụ. Ọ sị ""ọ bụ ụlọahịa m dị ihe a, a kpọrọ m ebe 2:30 nke ụzụ ụtụtụ, m gbara ọsọ bịa, tupu m na-abịa ọ bụrụ na ọkụ agbachaala ụlọahịa m"" Onye ntaakụkọ BBC ji anya ya hụ ụlọ abụo akpọo 'Plaza' nwere ọtụtụ ọdọ ahịa n'elu nakwa n'ala chọpụtara na ọdọahịa ndị gbara ọkụ karịrị iri ise. Gbasara enyemaka gọọmentị na-enye ndị ahịa ahụ, Odiagu sị na ọ nụrụ na osote Gọvanọ Anambra steeti bụ Gilbert Ibezim bịara nleta n'ahịa ahụ mana o jighi anya nke ya hụ ya. Gọvanọ Chukwuma Soludo ezipụtala ozi iti aka n’obi nye ezinaụlọ nakwa ndị niile ihe ọdachị a metụtara. Ozi ya kọwara “Ndị ọrụ gbata gbata mmenyụ ọkụ gbara mbọ menyụọ ọkụ a melitere ịgba ebe awa nke mbụ n’isi ụtụtụ Mọnde.” “Anyị na-agba mbọ ịhụ na anyị tinyere usoro nchekwa maka ọkụ ndị a na-agba kwa mgbe kwa mgbe” Soludo gara n’ihu kwuo na onyela Osote ya bụ Onyekachukwu Ibezim iwu na kọmịshọha ọkụ latrịka na mmiri bụ Julius Chukwuemeka nakwa Kọmịshọna ọrụ pụrụiche bụ Sly Ezeokenwa ka ha mee njem nleta gaa ebe ya bụ ihe mere ma zigara ndị ahụ ozi n’iti aka n’obi zuruoke. Dịka naanị izuụka abụọ gachara ka ọkụ gbara ahịa n’Ogbogwu dị n’Onitsha Anambra Steeti, aọkụ agbaala akụkụ Kano steeti nke ahịa Main Market nke Onitsha. A na-ekwu na ya bụ ọkụ gbara ọtụtụ ngwa ahịa ndị mmadụ ma gbatuo ọtụtụ ụlọ ahịa ebe ahụ. Ndị ọrụ gbata gbata awụchịela dịka a na-agba mbọ imeyụ ya bụ ọkụ. Odeakwụkwọ ukwu ngalaba gbata gbata nke State Emergency Management Agency (Sema) n’Anambra bụ Paul Odenigbo gbara BBC Igbo ama ọnọdụ ọkụ ọgbụgba a ma kwuo: “Ya bụ ọkụ gbara n’ezie. Ọ malitere ịgba n’ime abalị dịka ndị nọ ebe ahụ siri kwuo.” “Ndị ọrụ anyị awụchiela dịka ọkụ a gbara n’ọdụ ahịa ebe a na-ere ihe ndị nwereike ịgba ọkụ ngwa ngwa dịka ntutu isi ụmụnwaanyị, ihe ntacha nakwa ihe ndị ọzọ” O kwuru na ka ọ dị ugbua na enweghi onye ya bụ okụ gbagburu maọbụkwanụ onye ọ merụrụ ahụ n’ihi ya bụ ọkụ gbara oge ndị mmadụ anọghị n’ahia. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kọwara ya bụ okụ gbara ngwa ahịa ndị mmadụ ọnụego ya ruru nde kwur nde. Ọ gara n’ihu kwuo “Nnyocha anyị gosiri na o nwereike ịbụ ọkụ latrịk kpatara ya bụ ọkụ ọgbụgba” Ikenga kwukwara na ndị orụ ka nọ ebe ahụ ugbua na-enyocha ya bụ ọnọdụ nakwa isi ọkụ ahụ. Akwa arịrị na-arị ibe ya elu n’akụkụ Kano street nke ahịa a bụ ebe ya bụ ọkụ malitere ịgba n’ime abali Sọnde. Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ nakwa ndị agha Naịjirịa nọ n’ọrụ ebe ahụ dịka amabeghị ma e nwere ya bụ ọkụ merụrụ ahụ maọbụ gbagbuo." https://www.bbc.com/igbo/articles/czdyk1z20qdo +politics Inec: A kwụsịla ikesa asambodo mmeri na Zamfara "Inec akwụsịla nkesa asambodo mmeri na Zamfara Dịka Inec sị akwado ikesala asambodo mmeri na steeti dị icheiche, Zamfara esoghi na steeti ebe a ga-eke asambodo na Wensde 27 Maachị, afọ 2019. Legọs gụnyere ebe ndị agaghị enye echi n'ihi na ebufeela ụbọchị a ga-enye asambodo mmeri ruo ụbọchị Fraide 29 Maachị, afọ 2019 Ha kọwara n'akara Twitter ha na ọ bụ iwu ụlọikpe nyere ka ha jiri kwụsị ya bụ emume a kwadoro mbụ. ""Anyị na-eleba anya n'ikpe ụlọikpe nyere gbasara ndị na-azọ ọkwa n'okpuru otu APC"" so na nkọwa ha nyere. Dịka ọ dị ugbua amabeghi mgbe ha ga-emecha nyocha maọbụ kesa ya bụ asambodo ndị mmeri kwesiri ịnweta. 'PDP ohere adịghịrị unu n'ọchịchị a' -Oshiomole Onyeisioche APC bụ Adams Oshiomhole ekwuola na onweghị ihe ga-eme ka APC nabata PDP na ọchịchị nke agbaa. Oshiomhole kwuru nke a mgbe ndị pati ha nwere ọgbakọ n'Abuja ụbọchị Monday bụ ebe ha nọkwa kapịa ọnụ maka ndị ha ga-ahọpụta ga-abụ ndị isi ụlọ omeiwu ukwu na nke nta. Gọvanọ Abubakar nke Bauchi onye ji ọkọlọtọ APC na ntuliaka 2019 ebunyela okpokpo ekele ga onye meriri ntuliaka Bauchi steeti bụ Senator Bala Mohammed. O mere nke a site n'akara Twitter ya: Aka ndị uweojii akparala mmadụ abụọ ana eche na aka ha dị na ogbugbu nwaanyi nọsụ na-arụ ọrụ na Federal Psychiatric Hospital, Enugu. Maria Amadi na-abanye n'ụlọ ya na Trans Ekulu mgbe ndị omekome ji egbe napụ ya ndị ya n'ike ụbọchị Tọzde gara aga. Izrel amalitela ịtụ ogbunigwe na Gaza strip bụ nke a sị na-ometuru ụlọ onyeisi ndị Hamas. Izrel sị na ọ bụ Hamas bụ ụzọ tụbata ogbunigwa na Mishmeret nke Izrel. Onyeisi mba Izrel bụ Benjamin Natanyahu dọrọ aka na ntị na ya agaghị anabata ụdị egwuruegwu ahụ. N'egwuruegwu e, Victor Osimhen eturula ugo dịka onye nyere golu atọ na-otu asmopi bụ nke ndi Nigerian Olympic Eagles ji merie ndi Libya n'Asompi iko mba Afrika agbara n'Asaba ụbọchị Monde. Nigeria ji ọkpụ ano achitaghị aja merie Libya iji gbara isi onwe ha na ọkpụ abụọ Libya gbara ha na-asompi ndị ntorobia nke Afrika." https://www.bbc.com/igbo/47690664 +business International Poverty Eradication Day: Lee ụzọ ị ga-eji were ekwentị gị kpatawa ego "Ụwa na-agbanwe n'ike n'ike dịka tekịnụzụ na-akawanye mma kwa ụbochị. Ịntaneetị so n'otu n'ime ihe wetara mgbanwe pụrụiche n'ụwa nke mere ọtụtụ ji ekwu n'ụwa ugbua dizi ka otu obodo (Global village). N'ihi mgbanwe a ịntanetị wetara, ohere buru ibu mmadụ ị nọ n'ụlọ ya, were igwe kọmputa maọbụ ekwentị ya na-akpatara onwe ya ego. Ụbọchi 17 nke ọnwa Ọktoba ọbụla bụ ụbọchị otu 'United Nations' wepụtara iji kwalite mbọ a na-agba ikpochapụ ụbịam n'ụwa niile. A na-akpọ ụbọchị a na bekee ""International Day for the Eradication of Poverty"", bụ nke a malitere afọr iri atọ na ise gara aga, na 1987. Isiokwu emume a nke afọ 2022 bụ ""UGWU DỊỊRỊ NDỊ ỌRỤ NIILE: Mbọ anyị na-agba maka oke ruuru onye, udo nakwa ọdịmma ụwa."" Nnyocha egosila na otu ihe nyere aka n'ibelata ụbịam n'ụwa bụ ịntaneetị, maka na o mepeela ọtụtụ ohere nke mmadụ nwere iji nyere ndụ ya aka. Iji maa atụ, ekwentị a mmadụ na-eji akpọ maọbụ na-aza oku nwere ọtụtụ uru ọ bara iji nyere mmadụ aka kpọpụ onwe ya n'ụbịam. Ọkaiwu Anulika Enemuo bụ onye ihe gbasara ịkpata ego n'ịntaeeti (online business) doro anya, kọwaara BBC Igbo ụfọdụ ihe mmadụ nwere ike iji ekwentị ya na-eme iji na-akpata ego. Onye ntoroọbịa ọbụla ị kpara aka n'ọnụ ugbua, ọ sị gị na ya etinyela ego ya na Bitcoin. Bitcoin bụ ụdị ego anaghị ahụ anya; Bekee kpọrọ ya 'Digital Currency' maọbụ 'Virtual Currency' maọbụ 'Cryptocurrency'. Iwu Naịjirịa amachighi mmadụ itinye aka n'ụdị ego a, mana ọ dịkwa mkpa ka mmadụ mara ụlọọrụ ọ na-etinye ego ya n'aka ha. Ọkaiwu Enemuo dọkwara aka na ntị ka mmadụ hie asaa n'anya ugbua tupu i tinye aka na 'crypto', maka na ọtụtụ adịgboroja dị nke nwere ịnapụ mmadụ nwa ntakịrị ego nke o nwere enwe. 2. Ire ahịa n'ịntaneetị (Online retail business) Ọtụtụ ụlọahịa dị n'ịntaneeti ebe mmadụ nwere ike idebanye aha ma malite ire ahịa. Otu onye achọghị ka a kpọpụta aha ya kwuru na ya nwere ụdị ụlọahịa a ebe ọ na-eresi ndị mmadụ ihe dị icheiche dịka akwa, akpụkpọ ụkwụ, ntutuisi aka mere, dịrị gawazie. O kwuru sị: ""Ihe m na-eme bụ itinye foto ihe ndị a n'akara Instagram, facebook, nakwa Whatsapp, mana ọ bụghị na azụtala m ha."" ""Kama ọ bụrụ na mmadụ chọọ ịzụ ihe ndị ahụ, aga m aga n'ahịa zụta ya, ma tinye obere ego n'elu (uru) ya iji resi onye ahụ."" ""Ana m ewegara onye ahụ ngwaahịa ahụ n'ụlọ ya maọbụ n'ụlọọrụ ya, nke pụtara na ọ gaghị enye onwe ya nsogbu ịgawa ahịa."" Ọtụtụ ndị na-enweghịkwa ego ịchọrọ ụlọahịa, nwere ike zụta ngwaahịa ndị a debe n'ụlọ ha, ma werezie ekwentị ha na ịntaneetị na-egosipụta ya ka ndị mmadụ hụ ma zụrụ. Imirikiti mmadụ esila n'ụzọ dị otu a kpata ego nke ha ji nwetazie ụlọahịa nke ha, ma malite nke bụ ịtụ mgbere ahịa. Ọkaiwu Anuli kwuru na nkuzi so n'otu ihe mmadụ nwere ike iji ekwentị ya na-eme iji kpata ego. Ọ kọwara sị: ""'Coaching bụ ikuziri mmadụ ihe n'ụzọ onye ahụ ga-enwe ike itinye ya na ndụ ya ka ọ mịtara onye ahụ mkpụrụ."" ""E nwere ụdị 'coaching' dị icheiche dịka: Ikuziri mmadụ maka ọdịmma ahụike (fitness coach), ikuzi maka nchịkọta akụnụba (financial coach), ikuzi maka mkpata ego na azụmahịa (business coach), ikuzi asụsụ (language coach)."" ""Ụdị ihe ndị a bụ ihe mmadụ ga-ejinwu ekwentị ya mee, mana onye ahụ kwesịkwara ịma nke o riri tupu ọ malite ikuzi ya."" Nke a yitekwara 'coaching' mana ọ bụchaghị ya. Ọkaiwu Anuli kwuru na mmadụ nwere ike ide akwụkwọ gbasara etu e si eme otu ihe maọbụ nke ọzọ, ma na-ere ya n'ịntaneetị. Dịka Ọkaiwu Anuli si kọwaa, mmadụ nwere ike inyere onye ọzọ aka ire ngwaahịa ya, dịka akwụkwọ, ude, ọgwụ maọbụ ihe ọbụla nke ọ chọrọ ire. ""Mmadụ nwere ike inyere mmadụ aka ree ngwaahịa ya n'ịntaneetị iji nata obere ọmụrụnwa nke bekee kpọrọ 'commission'."" ""Iji maa atụ, ha abụọ nwereike kwekọrịta na ọ ga-akwụ ya otu narị naịra maka otu ngwaahịa o rere."" ""Onye ahụ ga-agbazi mbị iji ekwentị ya ree ngwaahịa ndị iji nara ọmụrụnwa ahụ ha kwekọrịtara."" Ihe ọzọ a na-akpọ 'Network marketing' bụ 'Multi-Level Marketing'. Nke a bụ mmadụ idebanye aha n'otu ụlọọrụ na-arụpụta ngwaahịa ma nyere ha aka na-agbasa ozi maka ngwaahịa ahụ ma na-erekwa ya. ""Dịka ị na-ere ngwaahịa, ị ga na-akpọtakwa ndị mmadụ ka ha na-esonyere ụlọọrụ ahụ,"" Ọkaiwu Anuli kwuru. ""Etu onye si gbaa mbọ ire ahịa nakwa ịkpọta ndị ọhụrụ ka ego ụlọọrụ ahụ na-enye ya ga-esi na-agbali elu."" ""Onye ọbụla nwere ekwentị ga-esinwu n'ụzọ dị otu a na-akpata ezigbo ego. Dịka ọtụtụ ji ise onyonyo mere akaọrụ, ndị ọzọ jikwa ise onyonyo nke ekwentị mere aka ọrụ. Ọtụtụ ekwentị juru n'ahịa ugbua nke ose foto (camera) dị na ha siri ike karịa igwe ose foto ndị ọzọ. Enwere ọtụtụ ọba ozi ga-akwụ gị ụgwọ iji zụrụ foto mara mma nke i sere. Ndị ọzọkwa na-eji ekwentị ha ese ihe ejije eji akụzi ihe maọbụ akpa ọchị ma tinye ha na soshal midia dị icheiche iji kpata ego. A na-akpọ nke a 'social media content creating'. 8. Onye enyemaka anaghị ahụ anya (Virtual Assistant) Dịka mmadụ si enwe onye enyemaka n'ụlọọrụ, nke a kpọrọ 'personal assistant, otu a kwa ka e si enwe onye enyemaka anaghị ahụ anya nke bekee kpọrọ 'virtual assistant'. Ọrụ ha gụnyere: ""Ihazi ozi email, ime nnyocha (intaneeti), ide akwụkwọ anamachọ ihe (proposals), dịrị gawazie. Lee ihe ọzọ nwere ike inye gị ego site n'ekwentị gị: Mana chetakwa... Ọ bụghịzi ihe ọhụrụ na ọtụtụ ndị ekperima juru n'ịntaneetị na-ezu ndị mmadụ ohi. Ya mere o ji dị mkpa ihi asaa n'anya tupu itinye akara ọbaego na webụsaịt ọbụla. N'otu aka ahụ, mmadụ kwesịkwara ịkpachapụ anya maka nke bekee na-akpọ 'pyramid scheme'. Ụdị nke a bụ ndị na-asị gị weta otu puku naịra ka ha nye gi puku naịra iri n'ime awa atọ. Ọkaiwu Anuli kwuru sị: ""onye ọ bụla kwere gị nkwa ibute ụkwa n'osisi ụkpaka, biko gbalaga.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-55643365 +politics Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: APC Ekiti ahọpụtala ụbọchị mmegharị ntuliaka imeụlọ Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: E tinyela ụbọchị ọhụrụ maka ị me ntuliaka imeụlọ nke APC n'Ekiti steeti nke akagburu akagbu. Ndị isi pati APC họrọ ụbọchị iri n'otu nke ọnwa Mee (May 11) ka ha mechara nzụkọ gbatagbata maka ọgbaaghara mere na ntụliaka nke ha mere na Satode gaara aga. Ebola alaghachitela ọzọ WHO kwupụtara na mmadụ abụọ bu ọrịa ahụ, ebe mmadụ 17 nwụrụla díka a na-eche na ọrịa ahụ bidoro ọzọ na Bikoro dị na mba ahụ. Ndị uweojii anwụchiela otu abụọ ha kwuru na-azụ ahịa egbe na Benue steeti Ndị uweojii bokwara ndị a ruru iri n'otu ebubo na ha na-ebunye ndị ntọ na ndị omekome egbe ha jị arụ ọrụ mwakpo ndị mmadụ. Ha chọtara mgbọ, egbe dị icheiche na ngwa ọgụ ndị ọzọ ndị a bu agagharị. ...Ebe sinetọ akpọrọ Shehu Sani katọrọ ihe a ndị NAFDAC mere n'elu soshal midia Twitter: FIFA adaala Russia nha maka egwu ịkpa oke agbụrụ. FIFA dara mba Russia nha puku pounds iri abụọ na abụọ(22,000GBP) maka egwu ịkpa oke agbụrụ ndị na-akwado ha na-agụ mgbe otu France na Russia gbara bọọlụ n'ọnwa Maachị. Paul Pogba, Ousmane Dembele and N'Golo Kante ndị ọgba bọọlụ mba France bụ ihe ndị a metụtara. Ha kwuru na ha a gaghị enye otu ọbụla ohere ịkpa oke agbụrụ n'asọmpị iko mbaụwa n'abịa chaachaa. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa: https://www.bbc.com/igbo/afirika-44051540 +politics 2020 Prophecies: Ihe PDP sara Mbaka gbasara amụma 2020 """Mbaka ọ bụ ọkaikpe? Mbaka ọ bụ 'Supreme Court'? Ọ bụ sọ Mbaka bụ onye amụma Chineke na-agwa okwu?"" Nke a bụ ajụjụ Damian Opara bụ ọnụ na-ekwuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' nke Imo steeti na-ajụ. Opara jụrụ ajụjụ a gbasara amụma afọ ọhụrụ nke Mbaka buru. N'amụma ahụ, Mbaka kwuru na Hope Uzodimma ga-eweghara ọchịchị n'aka gọvanọ Emeka Ihedioha n'oge adịghị anya. Mbaka kwuru na ọ bụ Uzodimma bụ olileanya ndị Imo steeti. Cheta na Uzodimma so wee zọọ ọkwa gọvanọ ime n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC mana ọ dara. O mechara buru okwu ahụ gaa ụlọikpe ma dakwaa ọzọ. Na mkparịtaụka ya na ndị BBC Igbo n'ụbọchị Tọzde, Opara kwuru na amụma ahụ Mbaka buru enweghị isi. O kwuru sị: ""O doro anya na Mbaka bụ onye otu APC."" ""Ọ kwụnyere Buhari megide ndị Igbo na ntuliaka niile e merela."" ""Mana amụma ya abụghị eziokwu n'ihi na ụlọikpe 'Supreme Court' ekpebiela ikpe ahụ. Opara kwuru na ndị PDP nakwa ndị Imo steeti niile kwụ Gọvanọ Ihedioha n'azụ. O kwukwara na amụma Mbaka anaghị echu ha ụra n'ihi na ọ bụghị naanị ya bụ onye amụma Chineke na-agwa okwu. Amụma Mbaka buru maka afọ 2019 Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50970142 +health "World Cancer Day 2020: ""Etu m si chọpụta na m nwere Cancer"" - Anwuli Ojogwu" Chi jiri n'ehihie n'anya Anwuli Ojogwu bụ nwaagboghọ chọpụtara na ya nwere akpụ kansa n'afọ 2018. Chi ya gbaara ya ama n'oge maka ọrịa ahụ malitere ito ya n'ara n'afọ ahụ. Nke a mere mgbe Anwuli kụrụ obi ya n'ọnụụzọ ka o si n'ụlọekwu ya na-apụta. Nke ahụ mere ka ọbara sị ya n'ara na-agbapụta. Nke ahụ bụ ụzọ pụrụiche chi ya ji gbaara ya ama n'oge. Nke a mere ka ọ malite ịjụ ese ka ya bụ mmiri si baa opi ụgbọghọrọ. Lezie ihe nkiri a ka ịhụ ka o si mee. Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Chukwudi Okereke, Chiemela Peters Mgbahuru https://www.bbc.com/igbo/afirika-51378911 +politics Nasir El-Rufai: Ịpị amụ na ogbugbu bụ ihe chere onye dinara nwata n'ike na Kaduna Gọvanọ Nasir El-Rufai nke Kaduna Steetị etinyela aka n'iwu ga-eme ka a pịa nwoke ọbụla dinara nwaanyị n'ike nakwa wepu akpa nwa nwaanyị dinara nwata nwoke n'ike. Iwu ọhụrụ a pụtara na ntaram ahụhụ dịịrị nwoke maọbụ nwaanyị dinara nwata n'ike ga-abụ ịpị nwoke nakwa iwepu akpa nwa nke nwaanyị. A ga-ebipụta aha ndị dị etu a n'akwụkwọ mpụ na nrụrụaka nke mmekọrịta nwoke na nwaanyị nke ọkaikpe steetị ga-etinyeaka na ya. Site n'itinye aka n'iwu nke Gọvanọ El-Rufai mere n'ụbọchị 11 Sepụtemba, nke a pụtara na ọ bụrụ na iwu na Kaduna Steetị. Iwu a sibu na ọ bụ nga afọ 21 ka onye dinara okenye n'ike ga-aga, ma sịkwa na onye dinara nwata n'ike ga-aga nga ruo oge ọ nwụrụ. Mana, mmegharị iwu ahụ kpebiri na onye dinara onye gafere afọ 14 zute ịpị amụ maọbụ iwepu kpa nwa. Mmegharị ọzọ bụkwa itinye na onye dinara nwata n'ike ga-enwete ikpe ọnwụ. Gọvanọ El-Rufai kelere ndị Omeiwu Kaduna maka iwu ha binyere aka, ma kwuo na iwu tara akpụ ga-enye aka chekwa ụmụaka na steeti ahụ. Ihe ndị nọ n'iwu ọhụrụ a gụnyere: https://www.bbc.com/igbo/afirika-54187381 +business Anambra state budget: Ha ga-emefu N137.1b n'afọ 2020 Nke si Anambara steeti eru anyị ntị bụ na ụlọomeiwu ha ebinyela aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2020. Ha na-atụ anya na a ga-emefu ijeri otu narị na iri atọ na asaa na ụma. Tanka ọzọ bu mmanụ ụgbọala adaala n'Enugu state Nnukwu ọdachi gaara ata isi ọtụtụ mmadụ bụ nke e gbochiri n'ụtụtụ taa oge tanka bu mmanụ ụgbọala dara ma wụsachaa ihe o bu n'ebe ụzọ adịghị mma n'Ọnyeama dị n'Enugwu. Ebe o si dị mma bụ na ngwa ngwa ya bụ ihe mere, ndị ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ n'Enugwu steeti jiri akụrụngwa Kemịkal eji egbochi ọkụ wụsasịa n'elu ya bụ mmanụ ụgbọala na-awufu nke mere na ọkụ amaliteghị gbawa. Gụọ ya n'uju ebe a: Tanka ọzọ bu mmanụ ụgbọala adaala n'Enugwu steeti Onye agha egbuola ndị otu ya Arụ mere dị ka otu onye agha tụtụrụ egbe gbagbuo ndị otu ya asatọ ma merụọ abụọ ọzọ ahụ na mba Rọshịa. A mabeghi ihe kpatara, mana a na-ekwu na ọ dị ka isi ezuchaghị ya oke. N'egwuregwu, Nwaafọ Igbo bụ Wilfred Ndidi na ndị otu ya bụ Leicester city ga-ezute Southampton na Premier League. Amụmammiri egbuola ehi asatọ ọzọ n'Ondo steeti Egbeigwe agbagbuola ehi asatọ ọzọ n'ugwu Oyinmo Quarter, Ikare Akoko, nke dị n'okpuruọchịchị Akoko Nọt n'Ondo Steeti. Femi Joseph bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ sị na nchọpụta amalitela ka amara ebe mmiri sị baa opi ụgbọghụrụ. Mana onyeisi ndị Myetti Allah steeti ahụ bụ Garuba Bello sị na ya bụ okwu erubeghị ya na ntị. Nke a na-eme ha ehi iri atọ na isii (36) nwụburu na okpuruọchịchị Ifedore nke steeti ahụ ọnwa gara aga. BBC nụrụ na ndị ọchịehi nwe ya bụ ehi ndị nwụru mere ngwa ngwa resi ya ndị na-egbu anụ n'obodo ahụ, dịka onye Femi Joseph sị kwuo. Ọ sị na aka ndị uweojii akparalarị ndị ogbuanụ mmadụ anọ na otu onye ọchị ihe mere ihe ahụ. Otu ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress ekwuola na ndị otu ha nọ na steeti dị iche iche ga-enwete ntụzịaka ha na gọọmenti steeti ha ga-esi nwee nkwekọrịta ịkwụ ụgwọ ọnwa opekatampe. Amaechi Asuguni bụ onye nọchite anya onyeisi otu a gbara ama a mgbe ọ gwara ndị ntaakụkọ nke a n'ọgbakọ ha nwere n'Enugwu ụnyahụ. Nke a na-eme ka gọọmentị na ndị otu ọrụ a kpebiri maka ụgwọọnwa ahụ tọzde gara aga n'Abuja. Ọ gachaala abalị 182 gọọmenti etiti tinyere aka maka ya bụ ụgwọ opekatampe tupu e nwee ya bụ mgbebi. bụ ebe ha nọ kwete iji pasenti 23.2 bulie ụgwọọnwa ndị nọ n'ogogo nke asaa, jiri pasenti iri na abụọ bulie nke ndị nọ n'ogogo nke asatọ. A ga-eji pasenti 19 bugo ụgwọọnwa ndị ọrụ nọ n'ogogo nke itoolu ebe pasent iri na isii ga-eruwe ndị nọ n'ogogo nke 10 na 14. Ọgbakọ ndị gọvanọ ekwuola na ihe ruru steeti iri abụọ dị njikere ịkwụ ya bụ ụgwọọnwa ohuru. Mana Asuguni ekwuola ka ndị otu ha nọ na steeti ghara ịkụ mgbanụ na steeti ha ịnwe nkwekọrịta maka na ndị otu ha ga-ezitere ha ntuziaka ga-enyere ha aka ha na gọmenti ịkwekọrịta. EU na-eche maka ịgbatị oge UK N'ofesi, European Union na-eche ịnwe nzụkọ maka ịnyekwu Briten nwaoge ka ha nwee ike ịkpebi mgbe ha ga apụ na EU. Nke a na-eme dịka ndị omeiwu Briten kwekọrịtara ịme ntuliaka n'ọnwa Disemba. Ọtụtụ ndị omeiwu EU na-eche na ọ ga-adị mma inyekwu Briten ọnwa atọ ka ha were chịkọnata onwe ha maọbụ gbubie ya bụ oge ma ha mee ngwangwa. Mana France chọrọ ka enye ha nkenke oge site na Desimba 31 bụ mgbe e tinyeburu ya. N'egwuregwu, ama na unu anụla nke kpọtụrụ n'abalị ụnyahụ dịka nwaamadị akpụnaọnụ bụ Nicolas Pepe sị zọpụta Arsenal na ndagwurugwu nke ọnwụ. Pepe nyetere Arsenal goolu abụọ n'ime atọ ha jiri merie Vitoria Guimaraes bụ ndị satara abụọ n'ime ha. Akpụ Pepe n'ọnụ maka na ọ meghị nke ọma na asọmpị nke gara aga, mana ugbua, ọzọrola isi onwe ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50179476 +entertainment Igbo girls: Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ụmụnwaanyị Igbo Nwaanyị dị, nwaanyị adịkwa mana ọtụtụ ndị ga-ekwenyere gị ma ị kwuo na uru dị n'ịlụ nwaanyị Igbo. N'agbanyeghị na ọtụtụ ndị na-ekwu na ịlụ nwaanyị Igbo kachasị ada ọnụ, ọtụtụ ndị ga-agwa gị na uru dị n'ịlụ nwaafọ Igbo. Ọtụtụ ụmụnwaanyị Igbo na-abụ ngọzị, ha anaghị abụ ọgbatuhie nye di ha na ezinaụlọ ha. Ụmụnwaanyị Igbo na-abụ ezigbo nne na nwunye. Ihe ndị a a ga-eme ka ị lụọ nwaanyị Igbo? https://www.bbc.com/igbo/afirika-43750811 +health Gastroenteritis: Ọrịa gburu mmadụ 11 n'ime ihe karịrị 317 ofesara na Lagos - Mịnịstrị ahụike Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Legọs steeti gwara BBC na ọ bụ naanị mmadụ iri na otu nwụrụla n'ime ihe karịrị mmadụ narị atọ na iri asaa butere ọrịa gastroenteritis na-efegharị na Legọs. Tubosun Ogunbanwo bụ onye na-achịkọta mmekọrịta mịnịstrị ahụ na ndị mmadụ, kwuru sị na ha ejikpaala ọrịa ahụ mana sị na ọ ka nwereike iselite isi ma mmiri ozuzo ka na-ezo. Ha na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha gbaa mbọ na-edowe onwe ha ọcha ma gbaara ụfọdụ nri dị ka ihe si n'oke osimiri a na-esighi esi ọsọ. A na-atụ ndị isi ezughi oke ịga na Naịjiria Ngalaba na-ahụ maka ikike ruru mmadụ a kpọrọ Human Rights Watch akatọọla etu e si atụ ndị isi na-ezuchaghị oke ruru puku kwuru puku ịga ma kpọchie ha ebe ha na-anọ emegbu ha na Naịjirịa. Ha kwuru na ịtụ ịga a na mmegbu a abụghị naanị n'ụlọọgwụgwọ ka a na-eme ya, na o ruchara ma n'ụlọekpere ma nke ụka Kraịst ma nke alakụba, nakwa nke ndị ọdịnaala. Okwu a sonyere nzọpụta ndi uweojii zopụtara ndị mmadụ nọ n'ụdịrị ọnọdụ a na steeti dị iche iche. Ndị uweojii egbuola mmadụ abụọ Ndị uweojii mba Rwanda agbagbuola mmadụ abụọ si mba Uganda na nso oke ala ha. Ndị uweojii mba Uganda kwuru na ha na-enyocha ogbugbu mmadụ abụọ a ndị ogbo ha na Rwanda na-ekwu na a gbagburu maka esighi ụzọ ziri ezi gafee oke ala mba abụọ a. Nke a e meela ya ihe karịrị mmadụ iri a na-agbagbu maka otu ihe a kemgbe ọnwa Febrụwarị. Ndị uweojii anwụchiela onye otu ha A nwụchiela otu onye uweojii e jidere n'ihe onyonyo ka ọ na-ana akaazụ. Ndị uweojii kwuru na ha na-ekpe Sajent Onuh Makedomu ikpe imeụlọ maka nrụrụaka. Mana ndị mmadụ achọghị ịnụ nke ahụ, makana ha malitere ikwu na ọ bụghị taa ka ha nụwara maka 'nwụchi ndị uweojii'. Ihe CAN gwara NYSC Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ngalaba na-achịkọta ndị ụka kraịst na Naịjirịa bụ CAN, etinyela ọnụ na nchụpụ a chụpụrụ mmadụ abụọ n'ebe ha na-efe ala nna ha n'Ebonyi steeti. Rev Adebayo Oladeji kwuru na ekwesịghị ime ụmụagbọghọ ahụ ihe e mere ha maka nkwenye ha n'okwukwe ha. O kwukwara na ngalaba NYSC kwesịrị ịnabata ụfọdụ ihe. Ngagharịiwe Họng Kọng, Mgbọ atụla mmadụ na mba Họng Kọng dịka onye uweojii gbara otu onye na-eme ngagharịiwe egbe. Nke a ga-eme ya ugboro atọ onye uweojii na-agba mmadụ egbe kemgbe ọnwa Juun nosgbu a bidoro. N'egwuregwu, Kenneth Omeruo na Samuel Kalu so na ndị egwu Super Eagles tụgoro down n'Uyo ebe ha nọ akwado maka asọmpi ndị ga-etozu ịga Afcon nke 2021. Mara na Naịjirịa ga-ezute Bene Repọblik n'ụbọchị Wenesde bụ abalị iri na atọ nke ọnwa a. Ihe nkiri ga-amasị gị https://www.bbc.com/igbo/afirika-50372545 +sports AFCON 2021 Tournament: Etu Naịjirịa si kwụrụ n'AFCON a kamgbe ọ malitere Ihe mba Afrịka ọbụla kpụụ n'ọnụ ugbua bụ asọmpi Iko Mba Afrịka nke ga-ebiri ọkụ n'ụbọchị itoolu nke Jenụwarị, 2022. Nke afọ a bụ nke ugboro iri atọ na atọ, ga-akpọtụ na mba Kameroon bụ ndị ga-ele mba iri abụọ na atọ ndị ọzọ ọbịa. E kwesiburu ịgba ya n'ọnwa Juun afọ 2021 mana a kagburu ya n'ihi nsogbu ọrịa coronavirus metụtara egwu bọọlụ n'ụwa. Dịka ị na-anụ mkpọtụ maka asọmpi a e ji AFCON maara, ọ ga-adịkwa mma ka ị mata ihe ọbụ n'uju nakwa etu Naịjirịa si kwụrụ. AFCON pụtara African Cup of Nations bụ Iko Mba Afrịka nke egwuregwu bọọlụ ụmụnwoke. Ndị na-ahazi ya bụ otu jikọtara egwuregwu bọọlụ n'Afrịka bụ Confederation of African Football (CAF) na Bekee. AFCON bụ otu ụzọ gbara ọkpụrụkpụ e ji ewulite ịdị n'otu mba Afrịka niile, nke a bụ uru ọ baara. A na-agbakaarị ya n'ọnwa Juun/Julaị n'ime afọ abụọ ọbụla. Ọ na-efu otu ọnwa iji gbaa ya. Lee tebụlụ AFCON 2021 A tụmatụ ịmalite AFCON pụtara ihe n'afọ 1956, mgbe mba anọ dịka Ijipt, Sudan, Etiopịa na Saụt Afrịka hiwere CAF n'ọgbakọ FIFA e mere na Lisbon, Pọrtugalụ. Mana asọmpị AFCON malitere kpọmkwen n'ọnwa Febụwarị afọ 1957 na Khartoun bụ isiobodo Sudan. Naanị mba Ijipt, Etiopịa na Sudan sọnyere n'asọmpi ahụ. A gụpụrụ Saụt Afrịka maka iwu gọọmentị na-achị mgbe ahụ tinyere na ọ bụ naanị ndị ọgba bọọlụ isiọcha ga-aga asọmpi ahụ. Mgbe asọmpi AFCON malitere n'afọ 1957, naanị mba anọ na-eso agba ya, n'afọ 1961 ha ruru mba itoolu sonyere mana a gbara asọmpi itozuoke nke mbụ ya. Ọ bụ n'afọ 1963 ka mba ndị dịka Naịjirịa na Tunisia malitere ịgba asọmpi ahụ. N'afọ 1998 mba ndị na-agba asọmpi AFCON gbagoro iri na ise mana n'afọ 2017 mba iri abụọ na anọ malitere ịgba ya. Mba ọbụla gbara ndị mbụ n'asọmpi Iko Mba Afrịka (AFCON) ga-amaburu iko e ji ọlaedo mee nke a rụrụ na mba Ịtali. Otu CAF ga-enye mba ahụ ego dị nde dọla ise ($5,000,000) ma nye ndị ọgba bọọlụ ha mgbanolu ọlaedo (Gold medal) dị iri atọ. Ndị gbara ndị nke abụọ ga-enwete nde dọla abụọ na puku narị asaa na puku iri ise ($2,750,000) na mgbanolu ọlaọcha (Silver medal) dị iri atọ. N'otu aka ahụ, ndị atọ ga-erite nde dọla abụọ na puku narị abụọ ($2,200,000) na ọlanchara (Bronze medal) iri atọ. Ebe ndị nke anọ na-erite otu nde dọla na otu puku narị na puku iri asaa na ise ($1,175,000) nakwa ihe itiaka n'obi a kpọrọ 'Diplomas'. Ndị Super Eagles nke Naịjirịa malitere ịgba asọmpi Iko Mba Afrịka (AFCON) n'afọ 1963 bụ ebe e nyere ha ọkpụ goolu iri ma gbapụ ha n'ogogo mbụ. Asọmpi AFCON nke afọ a ga-eme ya ugboro iri na itoolu ha ga-agba. Kamgbe ahụ ha ebutela iko a ugboro atọ; n'afọ 1980, 1994 na 2013, gbaa ndị abụọ ugboro atọ. Mba Ijipt kachasị buo Iko Mba Afrịka, ha ebuola ya ugboro asaa. Lekwa ndị niile meriri African Cup of Nations (Afcon) kamgbe ọ malitere n'afọ 1957: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-59915471 +sports Liverpool vs Manchester City: Liverpool apịwaala Man City ọnụ ka ụdara ụgụrụ "Ndị Liverpool gosiri ndị Manchester City nkarị na mgbede ụbọchị ụka n'asọmpi ""English Premier League"". Ọkpụ goolu atọ chara acha ka ndị akwa ọbara ọbara ji pịwaa ndị akwa anụnụ anụnụ ọnụ ka ụdara. Tupu asọmpi a ebido, onye ọbụla nọ na-ekwu na ọgụ ahụ ga-aka aka. Mana ngwangwa egwu malitere Liverpool gosiri ihe ha ji bụrụ di na-alụ ndị Man City. Naanị nkeji asaa ka o were Fabinho iji were 'shot' dịka egbeigwe gbawaa neetị ndị Man City. O teghi aka Mohammed Salah mezuo ya abụọ na nkeji 13. Man City malitere ịgba lịkalịka ka ndi mmiri na-eri mana nke ahụ amịtaghị mkpụrụ. Mkpu niile ha tiri ka igwe VAR nye ha penariti oge bọọlụ kụrụ Alexander-Arnold n'aka dara n'ala aja. N'agba nke abụọ, Mane mezuru ya goolu atọ nke mere ka ndị Man City tọkịrị. Nke a pụtara na Liverpool jizi akara itoolu agafe Man City na tebulu EPL. Man City bụzị ndị nke anọ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50368537 +health Coronavirus: Idris Elba ebutela coronavirus Onye na-eme ihe nkiri a ma ama bụ Idris Elba ebutela coronavirus dịka o si kwuo n'akara soshal midia ya. Elba sị na e nyochara ya n'ụtụtụ taa ma chọpụta na o bu ọrịa coronavirus. O kwuru na ya na onye bu ọrịa a nwere mmekọ ahụ n'ụbọchị Fraịde. Ọ sị na onwebeghi etu ahụ si eme ya ugbua mana ọ gbachiela onwe ya n'ụlọ maka nke a. Ọ rịọkwara ka ndị mmadụ na-asa aka oge ọbụla ma dosa ebe ha bi ọcha mgbe niile. Mba Briten amachiela ime njem, ọgbakọ maka coronavirus Boris Johnson, onyeisiala mba Briten agbarụọla ihu kwuo ka ndị mmadụ bi na UK kwụsị ịme njem na-adịghị oke mkpa bụ nke ga-ebenata mmekọrịta ndị mmadụ na ibe ha maka mgbasa Coronavirus dịka ọnụọgụ ndị nwụgoro na ya bụ ọrịa rugoro iri ise na atọ. Johnso kwuru ka onye ọbụla nwere ike sị na ụlọ ha na-arụ ọrụ dịka otu n'ime usoro ọhụrụ gọọmenti wepụtara iji buso ọrịa a agha. O kwuru ka ndị rugoro afọ iri asaa nakwa ndị ahụ esichaghị ike nwere okwuo kpọrọ ihe. Ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja akwụsịla nchutu Adams Oshiomole dịka onyeisioche pati All Progressive Congress. N'ikpe ndị ọkaikpe atọ nke ọkaipke Abubakar Yahaya nọ n'isi ya chabiri n'ụbọchị Mọnde, kwuru ka nchutu Oshiomole nke ụlọikpe ukwu nyere iwu ya kwụsị. Ụlọikpe a sị na iwu a ga-adị ruo ụbọchị Fraịde mgbe a ga-eleba anya n'akwụkwọ Oshiomole gbara. Cheta na ụlọikpe dị n'Abuja nyere iwu n'ụbọchị 4 Maachị ka Oshiomole kwụsị igosi onwe ya ka onyeisi APC. Nlele nke mbụ ọgwụ mgbochi coronavirus ga-amakite ụbọchị Monde na mba Amerika, dịka anyị nụru. Mmadụ iri anọ na ise ahụ dị mma ekwetala ịnara ya bụ ọgwụ n'ụlọ ọchacha dị na Kaiser Permanente, Seattle. Ya bụ ọgwụ nwere oyiri ya bụ nje dị na ya mana ya bụ nje ezughị ibute ya bụ ọrịa n'ahụ mmadụ. Ndị ọkachamara na-ekwu na ọ ka ga-ete aka tupu amara ka ya bụ ọgwụ maọbụ ọgwụ ndị ọzọ na-emepụta ọ ga-arụ ọrụ. Ndị ọrụ Sayensi n'ụwa gbaa gburu na-agba mbọ ịmata ka ha aga emepụta ọgwụ mgbochi ọrịa a ngwangwa. Ndị weputere ego maka nnwale ọgwụ a nke mbụ n'ahụ mmadụ bụ ndị National Institutes of Health sị na ha mafere usoro nke mbụ e si anwale ọgwụ mgbochi bụ nke na-enye aka ịmata ka ya bụ ọgwụ ọ ga-adịkwa ire n'ahụ mmadụ. Mana ụlọọrụ na-ahụ maka ya bụ nchọcha bụ Moderna Therapeutics sị na usoro eji mepụta ya bụ ọgwụ bụ usoro e ji emepụta ọgwụ mgbochi kemgbe ụwa. Na Lọs Angelis dị na New Yọk dị Amerịka, ọ bụ emechiela ebe a na-ere nri na mmanya. Ghana, Kenya, Saụt Afịrịka nakwa ụfọdụ mba ndị ọzọ amachiela ndị si mba nje fesara ọfụma ịbata. Saụt Afrịka na Sierra Leone emechiela ụlọakwụkwọ. Moroko amachiela ụgbọelu si mba ofesi ịbata mba ahụ. Nke mere ka ụfọdụ na-aju ihe ji Naịjirịa. Ngalaba na-ahu maka mbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na nyocha e mere onye eche na o nwereike buru coronavirus n'Enugwu gosiri na ya bụ nje adịghị ya n'ahụ NCDC sị na ọ dị mkpa ichere ka emecha nchoputa tupu ndi mmadụ eburu asịrị kpagharịwa. Cheta na akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na ọ bụ otu nwaanyi si ofesi lọta ka a na-eme nyocha makana ọ na-akwa ụkwara. N'otu aka ahụ, Dọkịnta Ifeanyi Agujiobi bụ onye odeakwụkwọ kọmịsọna ahụike n'Enugwu, site n'akwụkwọ o nyere ndị mgbasaozi, kwenyekwere n'ihe NCDC kwuru ma sịkwa ka ndị mmadụ ka na-adị ọcha ma na-agbado anya. Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari etiela ndị igwe gassị gbara ka ogbunigwe na Legọs metụtara aka n'obi. Ọ sị na NNPC na-agba mbo ịchọpụta ihe kpatara ya bụ mberede. Ngalaba gbata gbata na Legọs kwuru na ha butere ozu mmadụ iri na asaa nwụru na ya bụ ọdachị ebe mmadu iri abụọ na ise merụrụ ahụ. Joe Biden na Bernie Sanders ji Donald Trump mere okwu ka ha zutere n'ogige achụmta vootu onye ga-ebu kọlọtọ pati demokrat zọzị ya ọchịchii n'ọnwa Novemba. Ha abụọ sị na Trump ezughi ka emee ma ncha, ọkachasị etu o si ebuso Coronavirus agha. https://www.bbc.com/igbo/afirika-51904229 +sports 2019 Caf player of the year award: Aha ndị ga-azọ ọkaibe nke asọmpi Afrịka agbaala "N'egwuregwu, Confederation of African Football ewepụtala aha ndị nwereike iso na nturu ugo ndị bụ ọkaibe n'egwu bọọlụ nke Afrịka na 2019. Mmadụ atọ ụmụnwaanyị ndị Naịjirịa na otu nwoke sọ na ndị ana elegara anya maka ya bụ nturu ugo. N'ime aha 30 ewepụtara, mmadụ 10 si Premia Lig. Mohamed Salah nke Ijipt bụ onye tugooro ya bụ ụgọ ụgboro abụọ sokwa na ndị ahọpụtara ga-eso zọọ ya na ndị otu ya na Liverpool bụ Sadio Mane nke Senegal na Naby Keita nke Guinea. Ndị ọzọ bụ Riyad Mahrez bụ onye nyere Algeria aka bute iko Nations Cup nke 2019. Mahrez sọ na mmadụ atọ ndị Algeria ọzọ sọ azụ nturuugo a. Ndị ọzọ aha ha pụtara bụ Denis Onyango nke Uganda na-echere ndị Mamelodi Sundowns goolu. Achraf Hakimi nke Morocco sokwa ya na Victor Osimhen nke Naịjirịa. N'egwuregwu ụmụnwaanyị, asaa na ime iri ha so gbaa iko mbaụwa nke France 2019. Nigeria were mmadụ atọ na ya bụ akwụkwọ bụ nke Asisat Oshoala so n'ime ya, ya na ogbo ya nke Saụt Afrịka bụ Thembi Kgatlana. Ndị ama ama n'egwu bọolụ na ndị ntaakụkọ bụ ndị họpụtara ndị a maka ya bụ nturuugo a ga-eme na Tuzde Ọnwa nke mbụ n'afọ 2020 na Ijipt. Achraf Hakimi (Morocco & Borussia Dortmund) André Onana (Cameroon & Ajax) Baghdad Bounedjah (Algeria& Al-Sadd) Carolus Andriamatsinoro (Madagascar & Al Adalah) Denis Onyango (Uganda & Mamelodi Sundowns) Eric Maxim Choupo-Moting (Cameroon & Paris Saint-Germain) Ferjani Sassi(Tunisia & Zamalek) Hakim Ziyech (Morocco & Ajax) Idrissa Gueye (Senegal & Paris Saint-Germain) Ismail Bennacer (Algeria & AC Milan) Jordan Ayew (Ghana & Crystal Palace) Kalidou Koulibaly (Senegal & Napoli) Kodjo Fo Doh Laba (Togo & Al Ain) Mahmoud Hassan""Trezeguet"" (Egypt & Aston Villa) Mbwana Samatta (Tanzania & Genk) Mohamed Salah (Egypt & Liverpool) Moussa Marega (Mali & Porto) Naby Keita (Guinea & Liverpool) Nicolas Pepe (Ivory Coast & Arsenal) Odion Ighalo (Nigeria & Shanghai Shenhua) Percy Tau (South Africa & Club Brugge) Pierre-Emerick Aubameyang (Gabon & Arsenal) Riyad Mahrez (Algeria & Manchester City) Sadio Mane (Senegal & Liverpool) Taha Yassine Khenissi (Tunisia & Esperance) Thomas Partey (Ghana & Atlético Madrid) Victor Osimhen (Nigeria & Lille) Wilfred Ndidi (Nigeria & Leicester City) Wilfried Zaha (Ivory Coast & Crystal Palace) Youcef Belaili (Algeria & Ahli Jeddah) African Women's Player of the Year Ajara Nchout (Cameroon & Valerenga ) Ange N'Guessan (Ivory Coast & Tenerife) Asisat Oshoala (Nigeria & Barcelona) Chiamaka Nnadozie (Nigeria & Rivers Angels) Elizabeth Addo (Ghana & Jiangsu Suning) Gabrielle Ouguene (Cameroon & CSKA Moscow) Refiloe Jane (South Africa & AC Milan) Tabitha Chawinga (Malawi & Jiangsu Suning) Thembi Kgatlana (South Africa & Beijing Phoenix FC) Uchenna Kanu (Nigeria & Southeastern Fire) Ali Maaloul (Tunisia & Al Ahly) Anice Badri (Tunisia & Esperance) Denis Onyango (Uganda & Mamelodi Sundowns) Emmanuel Okwi (Uganda & Simba) Ferjani Sassi (Tunisia & Zamalek) Fousseny Coulibaly (Ivory Coast & Esperance) Franck Kom (Cameroon & Esperance) Herenilson (Angola & Petro de Luanda) Ismail El Haddad (Morocco & Wydad Casablanca) Jean Marc Makusu (DR Congo & AS VITA) Kodjo Fo Doh Laba (Togo & RS Berkane / Al Ain) Mahmoud Alaa (Egypt & Zamalek) Meddie Kagere (Rwanda & Simba) Meschack Elia (DR Congo & TP Mazembe) Taha Yassine Khenissi (Tunisia & Esperance) Tarek Hamed (Egypt & Zamalek) Themba Zwane (South Africa & Mamelodi Sundowns) Trésor Mputu (DR Congo & TP Mazembe) Walid El Karti (Morocco & Wydad Casablanca) Youcef Belaïli (Algeria & Esperance / Ahli Jeddah) African Youth Player of the Year Achraf Hakimi (Morocco & Borussia Dortmund) Amadou Haidara (Mali & RB Leipzig) Amadou Sagna (Senegal & Club Brugge) Enock Mwepu (Zambia & Red Bull Salzburg) Ismaïla Sarr (Senegal & Watford) Krépin Diatta (Senegal & Club Brugge) Moussa Djenepo (Mali & Southampton) Moussa Ndiaye (Senegal & Excellence Foot) Musa Barrow (Gambia & Atalanta) Osvaldo Pedro Capemba 'Capita' (Angola & Primeiro de Agosto) Patson Daka (Zambia & Red Bull Salzburg) Samuel Chukwueze (Nigeria & Villarreal) Sekou Koita (Mali & Red Bull Salzburg) Steve Regis Mvoue (Cameroon & AS Azur Star) Victor Osimhen (Nigeria & Lille) Zito Luvumbo (Angola & Primeiro de Agosto) Aliou Cisse (Senegal - Senegal) Christian Gross (Switzerland - Zamalek) Corentin Martins (France - Mauritania) Djamel Belmadi (Algeria - Algeria) Faouzi Benzarti (Tunisia - Wydad Athletic Club) Gernot Rohr (Germany - Nigeria) Moïne Chaâbani (Tunisia - Esperance) Mounir Jaouani (Morocco - Berkane FC) Nicolas Dupuis (France - Madagascar) Pitso Mosimane (South Africa - Mamelodi Sundowns) Alain Djeumfa (Cameroon) Bruce Mwape (Zambia) Clementine Toure (Ivory Coast) Desiree Ellis (South Africa) David Ouma (Kenya) Thomas Dennerby (Nigeria) Algeria Madagascar Nigeria Senegal Tunisia Cameroon Ivory Coast Kenya Nigeria South Africa Zambia" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50539523 +entertainment Peruzzi: Ihe jikọrọ mụ na Chioma na ihe masịrị m maka ndị Igbo Tobechukwu Okoh Victor bụ otiegwu a ma dịka Peruzzi ekwuola etu o si bụrụ onye a ma ama n'iti egwu ugbua. Peruzzi gwara BBC Igbo ihe o che maka 'esemokwu' dị n'etiti ndị otiegwu David Adeleke (Davido) na Ayo Balogun (Wizkid). Ọ kọwakwara ihe jikọrọ ya na Chioma bụbu enyi nwaanyị Davido, bụ onye akụkọ fesara na ha abụọ yịrị tupu o zute Davido. Peruzzi kwukwara ihe o che maka ịbụ onye Igbo nakwa ihe ndị ọzọ. Gere ya n'uju ebe a Ndị mere akụkọ a bụ Chimamaka Ihenacho na Vining Ogu Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-57108782 +entertainment Actress Doris Chima: Ihe ị kwesịrị ịma maka nwaanyị a lara mmụọ taa "Nwaanyị na-eme ejije ""Nollywood"" a ma ama bụ Doris Chima alaala mmụọ. Akụkọ kwuru na ọ bụ ọrịa akpụ kansa dulara ya mmụọ. Dịka akụkọ si kwuo, Emeka Ibe bụ onyeisi otu ndị ejije bụ Actors Guild of Nigeria (AGN) nke Legọs steeti, kwuputara na ọ nwụọla n'ezie. A mụrụ ya n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Febrụwarị 1958. Ọ bụ onye Abịa steeti. Facebook ya gosiri na ọ bụ mama nnukwu, dịka ụmụ na ụmụ ụmụ gbara ya gburu gburu. Ụfọdụ ejije ndị o mere gụnyere 'Taboo II', Divided Love', 'Sweet Mother', 'Treasure', 'Taxi Driver' 'Beauty Parlour' nakwa ndị ọzọ. O mekwara ejije a kpọrọ ""Nana of Niger Delta"". Dịka aka ochie ọ bụ, o so na ndị hibere otu jịkọrọ ndị ejije bụ ""Actors Guild of Nigeria (AGN)"", ma bụrụkwa osote onyeisi AGN nke Legọs steeti. E nwere mgbe o wuru ewu dịka otiegwu, mgbe o so mee asọmpi ndị na-agụ egwu nke ndị ụlọntaakụkọ Nigerian Television Authority (NTA) haziri n'afọ 1991. Akụkọ kwuru na ọrịa kansa mere ya ịwa, nke mere a waa ya ahụ n'afọ 2020." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58237216 +politics Etu DSS si kwụsị onye nnọchiteanya mba Briten bịara ịleta Nnamdi Kanu - Ifeanyi Ejiofor "Otu onye ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor etiela mkpu maka etu ndị uweojii pụrụiche bụ DSS si gbochie ndị mmadụ abụọ ịhụ Kanu. Ndị ahụ e gbochiri bụ Chukwuemeka Ezeife nakwa onye na-anọchi anya mba Briten bụkwa mba ọzọ Kanu si. Ejiofor kọwara na ihe a DSS mere megidere iwu ụlọikpe nyere nke kwuru na mmadụ atọ ọbụla Kanu chọrọ nwereike ịhụ ya. Mgbe onye nnọchiteanya mba Briten si Legọs bịa Abuja ịhụ Kanu, Ejiofor kwuru na ndị DSS gwara ya na o nweghi ike ịhụ Kanu n'ihi na ọ bụ onye mbịarambịara. O kwukwara na ha gbochiri Brue Fein bụ ọkaiwu mba Amerịka bịara ịleta Kanu ugboro abụọ n'ụbọchị 25 nke ọnwa Ọktoba n'agbanyeghi na e zigara aha ya n'aka ndị DSS tupu ha malite njem ịleta Kanu. Cheta na DSS egbochibuola Bruce Fein ịhụ Nnamdi Kanu n'ọnwa Ọgọst mgbe ha si na ezipuru ya ozi pụrụiche. Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob), akọwaala etu ndị ọrụ nchekwa si gbochie ha ịhụ ya anya ọzọ. Ejiofor bụ onyeisi ndị ọkaiwu Maazị Kanu kwuru na ndị Department of State Security Services (DSS) ekweghi ya na Bruce Fein bụ ọkaiwu na-ahụ maka okwu Kanu nke si mba Amerịka bịa, ịhụ ya anya. Ọ sị na ha gwara ya na onye (DSS) kwesịrị ịnabata ha ebe ha na-ahụ Kanu anọghị n'ụlọọrụ ha ịnabata ha ""n'ihi na ọ gara ozi pụrụ iche e zipuru ya"". Ejiofor kwuru sị na ihe a ndị DSS kwuru enweghi isi dịka o soghi na usoro ụlọikpe nyere maka ileta Nnamdi Kanu. Ọ gakwara n'ihu kwuo na kemgbe ha na-abịa elete Maazị Kanu na ha ezutetubeghi ụdị ọnọdụ a dịka ha na-eso usoro oge nakwa ụbọchị ndị ọrụ DSS nyere ha ka ha bịa lete ya. N'okwu ya, o kwukwara na kemgbe ha ji abịa njem nlete enwetubeghi mgbe e ji si ha na enwere onye pụrụiche kwesiri i na-anabata ha, nke ka njọ bụ na ndị ọrụ DSS bụ ndị nyere ha ụbọchị abụọ n'izu ka ha bịa lete Maazị Kanụ nke bụ ụbọchị Mọnde na kwa Tọọzde nke gosiri na ọ bibịa ha abughi ihe mere na mberede maọbụ ihe ndenye. Na nchịkọta okwu ya, o kwuru na ka ha na-achụ aja ka ikpe na ama ndị mmụọ na okwu Maazị Kanu, nke bụ na ha ga aga njem nlete n'ụbọchị Mọnde dịka ndị ọrụ DSS si gwa ha. O kwuru na ha na atụ anya na agaghi egbochi ha ịhụ Maazị Kanu anya ọzọ ma kwuo na ha ga agba mbọ zigara ndị ụlọikpe ihe a mere ma zipụtara ọha ozi n'okwu agwaa ọbụla ndị ọrụ DSS kpasara ha. Nnamdi Kanu jail visit: 'Ka ndị DSS si gbachaa anyị ọtọ mgbe anyị gara ịleta ya' - Ejiofor Onye ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor etiela mkpu ọhụrụ gbasara ihe ya na ndị ọkaiwu ndị ọzọ gabigara n'aka ndị uweojii pụrụiche bụ DSS. Nke a mere mgbe ha gara ịleta onye ọ na-anọchi anya ya bụ Nnamdi Kanu n'ụbọchị Monde ebe ndị DSS jichiri ya. N'ozi o wepụtara o kwuru na nke na-aga n'ihu n'agbanyeghi na ha tiri mkpụ maka aka ike ndị DSS mgbe ha gara ịleta Kanu n'izu gara aga. ""Nke a mere anyị ji kwuo na anyị enweghizi ezi nchekwa mgbe ọbụla anyị chọrọ ịleta onye anyị nọchiri anya ya"". ""Ọ na-atụzi anyị ụjọ ma ikpe Nnamdi Kanu a ka na-aga n'ihu n'ime ọnọdụ a anyị chọtara onwe anyị"" ka o kwuru. Ejioforo gara ihu kọwaa na agwa gosiri na ebumnuche gọọmentị bụ ime ka Kanu ghara ịnweta ikpe ziri ezi n'ebubo gọọmentị etiti boro ya. O kwukwara na Nnamdi Kanu na-ekele ndị nso ya maka etu ha si kwadosie ya ike ma nọgidere ya. Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor ekwuola na ndị ọrụ nchekwa pụrụiche bụ ""Department of State Services"" (DSS) kpasara ya na ndị ọkaiwu ndị ọzọ na-akwado Maazị kanu agwa na ezighi ezi dịka ha gara ileta ya na ụbọchị Tọọzde. Maazị Ejiofor kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zipụtara, nke isi okwu ya bụ ""Ihe mere ka anyị gara nleta nke ụbọchị iri abụọ na Isii n'ọnwa Ọgọstụ, 2021"" N'ozi ya, o depụtara na ndị ụlọọrụ DSS nyochara ha ka ndị ohi, meenye ha ihere, ma napụ ha akpụ ukwu ha ma nye ha nani ""Slippers"" ka ha yiri ga hụ Maazị Kanu na ụlọ nga ebe ndị ụlọorụ DSS ji ya. O depụtakwara na anapụrụ ha ugegbe anya ha, mkpisi na akwụkwọ ha ji ga ihụ ya. Na nchịkọta okwu ya, Okaiwu Ejiofor sị na ya ezigarala ụlọikpe ozi ka tinye anya na ụdị agwa a DSS kpasara ya dịka ọ bụ ndị ụlọ ikpe nyere ha bụ ndị ọkaiwu ikike ị a leta Maazị Kanu. Agwa a, n'okwu ya, bụ ihe mere ya ji ezipụta ozi a ka ọha nụrụ ihe mere. Maazị Ejiofor depụtara na ha agaghị anabata mmegbụ maọbụ mmaja ọbụla ma ha ga ileta Maazị Kanu ọzo dịka n'okwu o kwuru na ọ ma na ọ bụ atụmatụ ha imenye ha egwụ BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuchitere otu DSS bụ Peter Afunaya na ekwe nti ya taa bụ Fradịdee mana ọ kwuru na ọgaghị etinye ọnụ na ya bụ okwu ma ọ bụ eziokwu ma ọ bụ ugha. Chetekwa na Maazị Ejifor gwara ọha ka njem nleta mbụ ọ mere si gaa, ya bụ n'ụbọchị nke abụọ n'ọnwa Ọgọst nke so ikike ha natara ọkaịkpe nọ n'isi okwu a." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58339105 +entertainment New Igbo wife: Etu e si anabata nwaanyị a lụrụ ọhụrụ n'omenala Igbo "N'ọdị nso a ka onyonyo fesara etu ụmụnwaanyị Umueri si nabata Rita Dominic dịka ya na di ya bụ Fidelis Anosike mechara emume ịgba nkwụ ha. N'ezie, n'ọtụtụ obodo n'ala Igbo, a na-anabata nwaanyị a lụrụ ọhụrụ n'ụzọ pụrụ iche. Nnabata a ga-eme ka obi ruo nwaanyị ọhụrụ ahụ na ndị ezinụlọ ya ala n'ihi na ezinụlọ nwa ha banyere ji obi ọcha nabata ya. Tupu a lụọ nwaanyị n'omenala Igbo, e nwere ihe dị iche iche a na-eme, nke gụnyere: Ịjụ ese: Ọ bụghị naanị ndị chọrọ ịlụ onwe ha ga-ekwekọrịta ịlụ, ndị be nwoke na nke nwaanyị ga-ekwetakwa ma ụmụ ha a ga-alụ onwe ha. Ọ bụkwa n'oge a ka a ga-eleba anya ebe nwoke na nwaanyị ahụ si, marakwa ma ndị be ha a bụ ezigbo mmadụ, maọbụ e nwere etu ọbụla ha siri bụ nwanne. Maka n'ala Igbo, nwanne na nwanne anaghị alụ onwe ha, ọ bụ arụ. Ụgwọ isi nwaanyị: N'ụfọdụ ebe, ego a na-akwụ n'isi nwaanyị dị oke ọnụ ahịa, mana n'ụfọdụ ebe, ọ dịghị etu ahụ. Mana a na-akwụ ụgwọ n'isi nwaanyị maka etu be ndị nke nwaanyị siri zụlite ya ka ọ bụrụ ezigbo mmadụ dị mma ịlụ alụ. Ihe ndị ọzọ bụ: ịgba nkwụ, idu ụlọ, ịmata ụlọ di, dgz. Mana ihe ọzọ dị mkpa, bụ nke ọtụtụ mmadụ amaghị maka ya bụ etu e si anabata nwunye ọhụrụ ahụ na be di ya. Ọkammụta Chigozie Nnabuihe (Department of Linguistics, African and Asian Studies n'University of Lagos) kwuru na ịnabata nwunye ọhụrụ bụ omenaala, ọbụghị nso ala. BBC Igbo jụrụ Ọkammụta Chiagozie Nnabuihe, onye bụ ọkachamara n'asụsụ nakwa ọdịnala Igbo, bịakwa bụrụ onye nkuzi asụsụ na omenala Igbo na Mahadum Legọs, ka ọ kọwaara anyị. Nnabuihe kwuru sị na mgbe elu bụ ala ọsa, n'ebe ụfọdụ, ọ na-abụ na alụbata nwaanyị ohụrụ, ndị nne, ndị alụbatara n'ezi ahụ, na ụmụagbọghọ na-agbakọ anabata nwaanyị ọhụrụ a. ""Oge ahụ bụ oge a na-atụ anya na nwaanyị na-abịa na di amabeghi nwoke,"" Nnabuihe kwuru. ""Ka di na nwunye na-abanye n'ọnụ ụlọ ha, a na-akwawara ha akwa ọcha."" ""Ha bilie n'ụtụtụ, a ga-ele akwa ọcha ahụ, a hụ ọbara na ya, ha amara na ha nwetara ebele na-awaghi awa, nke pụtara na ha lụtara ezigbo nwaanyị."" ""Mgbe ahụ ka egwu otito ga-amalite iji too nwaanyị ahụ."" ""A na-ezighachiri ndị mụrụ nwaanyị ahụ ozi ito ha maka ịzụpụta ya. A na-akpọ ya 'nwaanyị di bịakwutere n'ụlọ'"". ""Ọ bụrụ na ọ dịghị etu ahụ, ha ga-eziga ozi mkparị na nleda anya ma kwuo na nne na nna nwaanyị ahụ enweghi ike ijide maọbụ zụlite nwa ha n'ụzọ kwesịrị."" N'ọtụtụ ebe n'ala Igbo, ndị na-abịa eso bee akwa e ji edụla nwa agbọghọ na di bụ ụmụagbọghọ ibe ya ndị so ya too n'ebe a mụrụ ya. Ọ bụ ha na-agụ egwu duru ya laa be di ya. Mana ọ bụrụ na o nwere ndị nke ha bụ ụmụagbọghọ maọbụ ụmụọkpụ a mụrụ n'ezi ahụ bụ ndị ga-abịa nabata ya, nke bụ eziokwu bụ na ọ dị mkpa na a nabatara ya, ka ọ mara na ọlụlụ ka a lụrụ ya, ọ bụghị ntụtụta ka atụtụtara ya. Cheta mgbe Rita Dominic bụ onye ejije a ma ama lụrụ nwoke si Anambra steetị, ụmụada gbakọrọ gụọrọ ya egwu, ọ gbara egwu bata n'ama di, gbara egwu banye n'ụlọ di ya. Ihe mere ịnabata nwunye ọhụrụ jiri dị mkpa bụ ịgosi na a lụrụ ya, ọ bụghị nzụta ka azụtara ya. Oge ahụ ka a na-egosi nwaanyị ụlọ ọhụrụ ya, ma gosi ya na a nabatara ya. O nwere ike isi ebe ahụ mara nwunye di ya ndị ọzọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61367374 +politics Anambra election: Kedụ uru ndị otu nnyocha ntuliaka a kpọrọ 'election monitors' na bekee ga-aba n'Anambra steeti? "Ndị nkịtị abụghị ndị ọrụ gọọmentị ịnyocha ntụlịaka amaliteghị taa na Naịjirịa. Kemgbe nụrụrụaka richara ibe ya elu na ntụlịaka e mere n'afọ 1964 nakwa nke e mere na ndịda anyanwụ n'afọ 1965, ya bụ ụgụrụ bụ nnyocha-ntụlịaka abụghịzị mbụ oyi na Naịjirịa. Ihe ya bụ nnyocha ndị esoghị azọ ọchịchị dị oke mkpa maka na nchọcha nwaamdị Ademola Adebisi chọpụtara na ọ na-eme ka ọchịchị onye kwuo uche ya kwusie ọkpa ike n'ala dịka ọ ga-enyeaka ịme ka usoro ntụlịaka gbaa n'anwụ ma gbakwa mgborogwu. Ọ bụ maka nrụrụaka ntuliaka nke gara aga mere Naịjirịa jiri webata nnyocha na ntuliaka malite n'afọ 1990. Otu dị iche iche si mba ofesi bụ nke ihe Naịjirịa na-amasị na-abịa nnyocha na Naịjirịa isonye ndị nke Naịjirịa. Ndị otu dị iche iche na Naịjirịa gụnyere otu nkwụụrụ onwe ha bụ 'Non-governmental Organisations' na Bekee, ndị ụka na ndị ọzọ chọrọ ịmata ka ya bụ ntụlịaka sị gaa na-abịa nyocha. Nchọcha Adebisi kwuru na nyocha maọbụ ịgbaakabe nke ntụlịaka nyekwara aka ịkwalite ntụkwasịobi ndị mmadụ n'ọchịchị onye kwuoụche ya agbanyeghị na ọ nwere ụfọdụ ndị nke Naịjirịa na-emenyere ndị pati ha chọrọ n'ọchịchị. Nke a mere e jiri chewe nnyocha maọbụ ịgba akaebe ntuliaka nwereike ịbụ ọgbatauhie karịa ngọzi nye ọchịchị onye kwuo uche ya. Tupu a nabata ntuliaka dịka ihe e mere n'ụzọ kwụọtọ, ọ ga-abụ ihe igwe mmadụ kwere na o gosiri ụche ya. Ndị ọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) nwekwara usoro ha depụtara ndị di otu a kwesiri iso. Ụlọọrụ a na debe aha ndị niile chọrọ iso rụọ ya bụ ọrụ n'akwụkwọ ha ma nye ha akwụkwọ ikike ha ga-eji agagharị ụbọchị ahụ. Ọ bụ akwụkwọ ikike dị otu a na-enye ha ohere ịba ebe niile a na-eme ntuliaka. Ndị nọ ọrụ nnyocha maọbụ ịgba akaebe ntuliaka na-apụ n'ụzọ ụtụtụ ụbọchị ahụ yiri uwe na akwụkwọ ikike ha Bekee kpọrọ ""ID card"". Ndị nọ n'ime obodo ga-eji ọkpa gawa wọdụ ebe a na-eme ntulịaka dị ha nso. Ha ruo ebe ahụ, ha na-akọwara ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ Inec nọ be ahụ onwe ha. Ha na ajụ ha ajụjụ dị iche ịche nke gụnyere ma ebutela akụrụngwa e ji arụrụ ọrụ? Ọ bụ ihe ndị a ka e ji amata ka ntuliaka ọ gara nke ọma ka ọ bụ na ọ gaghị. Ugochi Agalaba-Ehiahuruike bụ onye nnọchịte anya CLEEN Foundation n'Anambra steeti nakwa onye otu Nigeria Civil Society Situation Room sị na ndị nnyocha ntuliaka na-enweta ọzụzụ pụrụiche na-enyere ha aka ị rụ ọrụ ha. Ugochi sị na 'anyị amalitelarị ọzụzụ ndị bụ nke anyị na-enye ndị isi ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche nakwa ụmụ ntorobịa, dịka ndị otu Ipob. Ọ sị na ọzụzụ dị otu a ga-enyeaka ka ha mata ihe a tụrụ anya n'aka ha mgbe o ruru. O kwuru na ndị ọgbakọ Situation Room ga-edupu ndị otu ha nọ n'Anambra ka ha ga gbaa akaebe n'okpuruọchịchị ha dị iche iche. Ndị dị otu a ga-esi n'okpuruọchịchị ndị a zitere ha mpụtara ntuliaka dịka ọ na-apụta ozugbo ozugbo. Ndị nnyocha ntuliaka ekwesighị itinye ọnụ n'okwu gbasara ịme ntuliaka ha na-enyocha kama ọrụ ha bụ ịkwu ihe ha hụrụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58883806 +business NBS 2019 Poverty and Inequality Report: 'Anyị amaghị ebe NBS sịrị nwete mkpebi ha maka Ebonyi' "Igbo kwuru si na ekwe kwụọ ama agbaa. Okwu a pụtara dịka ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara ọgụgụ akpọrọ ""National Bureau of Statistics"" wepụtara etu ubiam si dị na steeti dị iche iche na Naijiria. Mwepụta a gosiri na Ebonyi steeti kacha bụrụ steeti nwere ndị ogbenye na mpaghara ọwụwa anyanwụ. Dịka ha nwere pacenti iri asaa na itolu na ụma bụ ndị ogbenye. Etu a ka ọ dịkwa ha n'afọ abụọ gara aga. Guọ maka nke ahụ ebe a: Ebonyi so kachasị daa ụbịam na Naịjirịa. Anyị a na-ajụ ""ọ bụ na agụba adịghị nkọ ka ọ bụ na ọkpụisi amaghị akpụ?"" BBC kpọtụrụ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Ebonyi steeti bụ Uchenna Orji maka ihe gọọmenti Ebonyi nwere ikwu maka nyocha a. Orji kwuru na ọcheghị na nyocha ndị ngalaba NBS mere zuru oke. O kwuru na enwere ọtụtụ ụzọ esi atule mmepe na ọdịnma ndị obodo. Orji kwuru sị "" Ọ bụrụ ahụike,ihe obodo ji ebi, agụm akwụkwọ, nchekwa obodo na ịkwalite ndị obodo bụ ụzọ ha siri mee ntule ha, ha mara na nke ahụ bụghị eziokwu"" O kwuru na Mgbe ngalaba ahụike WHO nyochara maka ụmụaka amụru ọhụru ị di ndụ, ha chọpụtara na nke Ebonyi steeti so na nke kacha mma. Orji kwukwara na ọ bụ mpaghara ọchịchị nke dị na Ebonyi steeti kacha bụrụ mpaghara nwere ndị bara mahadụm n'afọ 2017. O kwuru na ọbụghị ị ga ime obodo jụọ ndị mmadụ ego ole ha na-erete n'ahịa ma ọ bụ ụdịri ụlo ha bị, O kọwara na nke a abụghị ụzọ ziri ezi n'ihi na ndị Ebonyi steeti abụghị ndị anya ukwu. Ọ rụtụrụ aka na ụlọọrụ ngalaba NBS nke dị na Ebonyi na anọkarị na mgbachi, ma keduzie etu ha ga-esi rụọ ọrụ ha nkeọma. Ajụjụ kacha mkpa ugbua bụ kedụ etu ndị bi na steeti niile nọ n'ọwụwa anyanwụ ga-esi gbanahụ ụbiam? Ọkammụta n'ihe gbasara akụnụba obodo bụ Kachi Ononude tupenyere BBC azụ etu steeti nọ n'ọwụwa anyanwụ ga-esi gbanahụ ubiam okachasi n'Ebonyi steeti. Lee ihe okwuru. 1. Gọọmenti steeti ikwalite ndị steeti ha. Maazị Ononude kọwara na ọ dị mkpa ka gọọmenti steeti niile tinye uchu na ikwalite ndị steeti ha. O ji Ebonyi steeti were kọwaa na Gọvanọ Dave Umahi agbaligo ịrụpụta ihe dị iche iche eji enyere obodo aka dịka okporo ụzọ na ihe ndị ọzọ. Kama i lee anya, ọtụtụ ndị ntorobịa na-ere ihe n'okporo ụzọ steeti dị iche iche na abụkari ndị si Ebonyi steeti. Nke a gosiri na enweghị ọrụ maọbụ ihe ha ga-eji kwado onwe ha na steeti ha. Ononude kwuru ""Ebonyi bụ steeti Chukwu ji ihe ọnatarachi dị iche iche gọzie kama ọ naghị abara ndị steeti ahụ uru. Gọọmenti Ebonyi kwesịrị ihibe ụlọ ọrụ na arụpụta ihe ga-eme ka akụ ọnatarachi ndị a baara ndị Ebonyi uru."" Akụ ọnatarachi ndị a gụnyere nnu, osikapa, ọra igwe na ihe ndị ọzọ bụ ihe gọọmenti kwesiri iji kwalie ọnọdụ akụnụba ndị Ebonyi steeti. 2: Ụmụafọ steeti ihiwe ụlọ ọrụ na Steeti ha. Mazi Ononude kwuru na ọ dị oke mkpa ka ndị Ebonyi steeti nọ mba na obodo dị iche iche weghachi akụ ha n'obodo ha. Ọ kwuru si; ""I lee anya ị ga-ahụ etu ndị Imo steeti si mee ka Owere bụrụ ebe kacha nwee ụlọ oriri, ndị Ebonyi steeti nwekwara ike ime ka ejiri otu ụlọ ọrụ mara ha."" Nke a na-akọwa ka ndị Ebonyi steeti nwere ego were ego ha rụpụta ụlọ ọrụ dị iche iche iji nyere ndị steeti ha aka." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52548683 +politics Akụkọ kachasị mkpa: 'Ndị ZanuPF rapụtara m' - Mugabe Akụkọ dị mkpa: Onye bụbu onyeisiala mba Zimbabwe ekwuola na ọ gaghị akwado onye nọchịrị anya ya n'ọkwa ọchịchị bi Emmerson Mnangagwa n'ihi na ọ kwapụrụ ya n'ọkwa ọchịchi. O kwuru na ọ ga-atụnyere ndị ọzọ na ntuliaka a na-akwado ịme na mba Zimbabwe. Ndị uweojii n'Enugu steeti achọrọla nwoke na-ebiputa ego adigboroja gaa n'ụlọ ya dị na Legos ma nwuchie ya. Nwoke a aha bụ Collins Oputa bụ onye Ohaji n'Imo steeti arịọla mgbaghara ma kwuo na ọ bụ ọrụ aka ekwensu butere nke a. Ndị agha Naịjirịa egbuola mmadụ iri na isii so n'otu Boko Haram ma jichie ngwa agha ndị ọzọ na Borno steeti Onyema Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị agha kwuru na nke a mere mgbe ndị Boko Haram na-akwado i wakpo obodo Mairari dị na steeti ahụ. N'egwuregwu, Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF ekwuola na ha ga-enye Carl Ikeme ọkwa dịka onye nkuzi oche bọọlụ n'otu Super Eagles. Cheta na Ikeme wụsara bootu ya n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ abalị ole na ole gara aga. Gee Nkeji nke mgbede a Ihe onyonyo nke taa https://www.bbc.com/igbo/afirika-45000247 +politics Abịa Gọvernorship Election: Ikpeazu emeriela Otti n'ụlọikpe ntuliaka "Alex Otti bụ onye zọrọ ọkwa gọvanọ Abịa steeti n'aha otu Apga ekwuola na ya anabataghị mkpebi ụlọikpe ntuliaka kpebiri n'ụbọchị Friade. Ụlọikpe ntuliaka nọrọ n'ụmụahịa were kụpụ akwụkwọ nke Alex Otti gbara iji gbagha mmeri Okezie Ikpeazu Nke PDP meriri na ntuliaka e mere na abali itoolu nke ọnwa Maach na steeti ahụ. Jọstis Lekan Ogumonye onye bụ onyeisi ụlọikpe ahụ kụpụrụ arịrịọ niile Otti rịrọ ma kwuo na o gosighị ihe akaebe doro anya na ebubo ndị o boro bụ eziokwu. Mana Otti si na mkpebi ahụ adabaghị. Otti onye kwuru nke a site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Kazie Uko gwara BBC sị ""A nabataghị mkpebi ahụ."" ""Ndị ọkaiwu anyị na-atụle akwụkwọ mkpebi ahụ tupu e kpebie ihe ga-eme."" Mgbanwe ihu igwe na-aka njọ Ọtụtụ ndị na-agba mbọ maka nchekwa gburugburu emeela ngagharịiwe na legos, Abuja na Pọtakọt ụbọchị Fraide maka mgbanwe ihu igwe nke Bekee kpọrọ ""Climate Change. Ha tụrụ arịrị na oke idemmiri na-agba ike n'ebe dị iche iche na Naijiria so na nsogbu mgbanwe ihu igwe na-ebute. Na mba ofesi, A chọtala Peter Magombeyi bụ onyeisi otu ndị dọkịta na mba Zimbabwe nke e chere na a tọrọ na Satọde gara aga Mana gọọmentị mba ahụ na-ekwu na ntọ ya na nchọta ya dịka ihe a kpara akpa. N'egwuregwu, Otu AC Milan ehiwela otu ga-ahụ na ndị mmadụ ag aghị akpa oke agbụrụ n'asọmpị ha ga-agba na ngwụcha izuụka a. Onyeisi otu ahụ bụ Ivan Gazidis sị na o kwetara na otu ya kwesiri ịtịnye ọnụ ma gbanwee echiche ndị mmadụ gbasara ịkpa oke agbụrụ n'egwuregwu bọọlụ Gee Nkeji ebe a Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ga-ahapụ Naịjirịa n'ụbọchị Sọnde gawa ọgbakọ United Nations nke iri asaa na anọ na New York, mba Amerịka. Buhari ga-abụ onye nke ise ga-ekwu okwu n'ọgbakọ a. Cheta na e mere nwaafọ Naịjirịa bụ Tijani Muhammad-Bande onyeisioche ọgbakọ a n'onwa June 2019. N'aka nke ọzọ Ministrị na-ahụ maka mmiri ga-eme ihe ngosị gbasara idebe onwe na ezi ọcha Nke a na-atụ anya ga-eme ka ndị mba ọzo agbatara Naijirịa ọsọ enyemaka i ji kwụsị i ga mposị n'ezi. Aka akparala onye e che na-egbu ụmụnwaanyị na Pọtakọt Ndị uweojii egosila otu nwoke ha sị na ha che n'aka ya dị na ogbugbu ụmụnwaanyị n'ụlọ ndina na Pọtakọt, Rivas steeti . Ha sị na nwoke ahụ bụ onye Rivas Steeti si na okpuru ọchichị Buguma ma bụrụ kwa ọnye otu nzuzu akpọrọ debam. Nwoke a mere onye nke atọ ụweojii jidere maka echiche na aka ha dị na ogbugbu mmadụ a. Praịm Minista mba Iraq bụ Adel Abdul Mahdi adọọla aka na ntị ka egbochie ihe ọbụla ga-eme ga mba Amerika na Saudi Arabia lusoo mba Iran agha. O kwuru na agha dị otu a ga-agbasa karịa etu esi tụọ anya ma kwukwa na ohere dị ka achọọ ụzọ ụdo. N'asọmpi Ụropa agbara ụnyaaahụ ndị Manchester United ji otu ọkpụ goolu merie FC Asanta, Ebe ndị Arsenal ji ọkpụ goolu atọ asataghị otu gbaa Frankfurt ose n'ụlo ha ma ndị Sporting Braga ji otu goolu merie ndị Wolves n'ụlo ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49766628 +business Benin Market Fire: 'Ọkụ gbapịara ahịa mgbuka n'Uwelu, Benin metụtara ewu na ọkụkọ' "Akụkọ dị mkpa: Mkpu akwa hịọrọ n'elu n'ala mgbe ọkụ gbapịara ụlọahịa mgbuka dị n'Uwelu Benin, Edo Steeti. Akụkọ kwuru na ọkụ ahụ malịtere n'ime abalị nke mere na o nweghị ngwaahịa ndị mmadụ azọpụtanwuru. Otu onye na-azụ ahịa ebe ahụ aha ya bụ Joe gwara BBC Igbo na ọbụghị ahịa niile ka ọkụ ahụ gbara. Ọ kwuru sị: ""Ebe ọkụ a gbara bụ na A na kwa B 'line', ebe a na-ere akụrụngwa Mercedes, Mazda nakwa Ford'. ""Ihe ruru ọdụ ahịa iri atọ gbapịara n'ọkụ ahụ. ""O metụtara ọtụtụ ndị Bini, ndị Agbor nakwa ndị Igbo."" Joe kwukwara na osote onyeisi okpuruọchịchị ebe ahịa ahụ dị bịara n'ụtụtụ iji were ya hụ ebelebe gburunu. ""Mana ka ọ dị ugbua, onwebeghi ihe ọbụla anyị nụrụ n'ọnụ ndị gọọmentị. Nghotahie dapụtara n'etiti ndị agboro na ndị uweojii edulala otu onye mụọ, ebe mmadụ asaa merụrụ ahụ, dịka ndị uweojii Anambara steeti siri kwuo. N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed wepụtara ụbọchị Tuzde, o boro ebubo na ndị agboro chọrọ ịnapụ ndị uweojii bịara nnyocha maka ndị ojiegbeezu gbara ọsọ na-ezo n'ọdọụgbọala dị n'okporoụzọ Owere Road, dị n' Ọnịcha. Ọgbaghara nke butere kpachikpachi okporoụzọ mere ka otu onye uweojii gbaa egbe nke tụrụ otu onye. "" E bugara ya ụlọọgwụ a kpọrọ 'Toronto' ebe dọkịta kwuru na ọ nwụọla."" Mmadụ asaa ọzọ merụrụ ahụ ma na-anata nleta n'ụlọ 'Multichoice dịkwa n'Ọnịcha. Joe Igbokwe e sorola n'ihe a na-eme Nwa afọ Igbo bụ Joe Igbokwe ga-esonye na ndị ọnụ n'eru n'okwu na Legọs Steetị dịka aha ya so n'otu n'ime ndị kọmishọna iri na atọ nke Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu zịgara ụlọomeiwu steeti dịka ndị ga-eso ya rụọ ọrụ. Tupu a họpụta ya dịka kọmịshọna, Joe Igbokwe bụ odeakwụkwọ mgbasaozi otu APC na Legọs nakwa onyeisi 'Wharf Landing Fees Collecting Authority'. Mana a matabeghi ngalaba gọọmentị bụ nke a ga-enye ya ka o lekọtawa. Nke a bụ nke abụọ onye Igbo na-arụ dịka kọmịshọna na Legos. Ben Akabueze rụrụ ọrụ dịka kọmịshọna 'Economic Planning and Budget' agba abụọ bido n'afọ 2007 n'oge ọchịchị Babatunde Fashola dịka gọvanọ Legọs. Nwoke isi nkụka na Sydney N'ofesi, ndị uweojii nke mba Australia ekwuola na otu nwoke ji mma merụọ otu nwata nwanyị ahụ n'obodo Sydney nwetụrụ ọrịa isi. A na-arọkwa anya na ọbụ nwata nwoke ahụ sụgbukwara nwanyị ọzọ bụ onye e butere ozu ya n'okirikiri ahụ. Ọbụ ụmụokorobịa atọ aha ha bụ Lee Cuthbert, Paul O'Shaughnessy nakwa Luke O'Shaughnessy gbalịrị jituo nwoke ahụ tupu ndị ọrụ nchekwa abịaruo kpụrụ ya. Sneijder efeela aka N'egwuregwu ọgbaa bọọlụ onye mba Netherlands aha ya bụ Wesley Sneijder awụsala ọwa. Sneijder gbara bọọlụ ihe ruru afo iri na asaa ma nwetakwa nturuugo di icheiche nke gunyere iko Champions league, Serie A nakwa Coppa Italia. Ọ gbara bọọlụ n'otu egwuregwu ndị dịka Ajax Amsterdam, Manchester United, Real Madrid, Inter Milan nakwa Galatasaray. Ọgwụ Ebola na-arụ ọrụ N'oge na-adịghị anya, ọrịa ebola nwereike inwe mgbochi na ọgwụgwọ dịka ọgwụ abụọ ndị e nyochara gosiri nke a. N'ime ọgwụ anọ e nyere ndị bu ọrịa na mba Congo DR ebe ọrị a na-akpa ike, abụọ n'ime ha kparaike n'ịgwọ ọrị a. Ụlọọrụ mba Amerịka na-ahụ maka ọgwụ mgbochi ọrịa so mee nyocha ahụ sị na mpụtara nke a bụ ""ezigbo akụkọ"" n'ibu agha megide ọrịa Ebola. Ọgwụ ndị a bụ REGN-EB3 na mAb114 na-eji akụrụngwa dị mmadụ na-ahụ ebuso ọrịa Ebola agha ma kpagbuo ike ya. Ha kpara ike ruru pasentị iri itoolu (90%) n'ịgwọ ọrịa Ebola na nyocha ahụ e mere. Ọ bụ unu ji gọọmentị akwụla ụgwọ opekatampe ọhụrụ Gọọmentị etiti ebola otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa ebubo na ọ bụ n'ihi oke ọchịchọ ha mere a malitabeghi kwụwa ha ụgwọ ọpekatampe puku naịra iri atọ. Onyeisioche ụlọorụ na-ahụ maka ụgwọ ọnwa bụ Richard Egbule rịọrọ ndị ọrụ ka ha biko wedata aka na gọọmentị agbalịala site na nkwenye ibuli ụgwọ ọnwa ha. Ndị Naịjirịa nwụrụ n'emume Hajj 2019 Ọnụọgụgụ ndị Naịjirịa nwrụrụla ugbua na Saudi Arabia n'ihi emume Hajj nke 2019 e ruola itoolu. Onyeisioche ụlọọrụ na-ahụ maka Hajj bụ Ibrahim Kana gwara ndị ntaakụkọ nke a N'egwurgwu One na-agbara Naịjirịa bọọlụ bụ Henry Onyekuru ahapụla otu Everton nke mba Ịngland gawa mba Fransị ịgbara ndị Monaco bọọlụ N'aka ọzọ Michael Emenalo ahapụla ọrụ ya dịka onye ntuziaka egwuregwu bọọlụ na Monaco dịka ọ rụchara ọrụ afọ abụọ. Nkeji" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49328871 +politics Orlu Imo State: Kedụ ihe na-eme n'Orlu ugbua? "N'agbanyeghi kepukepu na-efegharị na soshal midia gbasara Orlu, ndị bi ebe ahụ na-ekwu na ha anụbeghị maọbụ hụ ihe ọbụla. Onyonyo na-agbasa na Twitter nke na-egosi ebe ụgbọelu helịkọpta na-efegharị; ọtụtụ na-ekwu na ụgbọelu ahụ na-akwa mgbọ. Odz Chioma onye bi na Orlu gwara BBC Igbo na enweghi ihe ọbụla gbara gharịị na-eme. O kwuru na ndị agha ka nọ ebe niile mana o nweghi onye ha na-enye nsogbu. Onye ọzọkwa kwuru na mpaghara Orlu ebe o bi enweghị nsogbu ọbụla. Onye a na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ụgbọelu Hhelịkọpta na-efegharị, ndị agha nọkwa n'ụzọ mana ha anụbeghị ụdaegbe ọbụla. Aka chịburu Imo steeti na onye bụ Sinetọ Imo West bụ Rochas Okorocha, onye nnọchiteanya ndị Orlu Imo State gara ebe ahụ, ka ọgbaghara dapụtara na ya biri. Ọ gwara ndị isi obodo na ndị bi n'Orlu ka ha jikọọ aka hụ na ọgbaghara dapụtara n'Orlu nke tara isi ọtụtụ mmadụ ma mebiekwa akụnaụba ndị mmadụ ghara ime ọzọ. O kwuru nke a mgbe ọ gara njem nleta nakwa iti aka n'obi na nke Eze Boniface Okereke so na ndị ihe metụtara. O hibere kọmiti mmadụ asaa ga-elebanye anya n'ọdịmma ndị ihe a metụtara ma nyekwa ha enyemaka ego na ihe ndị ọzọ ha chọrọ. O nyekwara ụmụaka niile nne maọbụ nna ha nwụrụ n'ọgbaghara ahụ onyinye agụmakwụkwọ n'efu. Ndị ọzọ ọ letakwara bụ ndị si mba Naịja nakwa ezinaụlọ ndị ọzọ ihe a metụtara. N'ọnụ ya ""Obi gbawara m mgbe nụrụ maka ihe mere ebe ụfọdụ ndị mmadụ gụnyere ndị nche tufuru ndụ ha, Ọ bụ ihe ọjọọ mere n'Orlu nke m katọrọ kpam kpam"" Nnamdi Kanu gwara ndị ESN wụsa ọwa n'Orlu Nnamdi Kanu bụ onyendu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ ndị na-achọ nnwereonwe Biafra nakwa otu Eastern Security Network (ESN), agwala ha wụsa ọwa n'Orlu. Nke a na-abịa dịka o kwuru na ọ nụrụ na a gwala ndị agha na ndị uweojii e zigara obodo ahụ mgbe ọgbaghara dapụtara si ebe ahụ pụta. Kanu gara n'ihu kwuo na ESN laghachị n'ịgbado anya n'ịhe gbasara nsogbu ndị ọchị ehi n'obodo ahụ. Kedụ ọnọdụ Orlu nọ n'ime ya ugbua kemgbe ndị agha na ndị a na-eche na ha bụ ndị Eastern Security Network (ESN) kwatachara? BBC garuru obodo ahụ iji anya ha hụ ka ihe dị ugbua. Eze dkt. E.C. Okeke gwara BBC Igbo na ndị mmadụ anaghị agagharịcha etu ha si emebu mbụ. Taa bụ ụbọchị Tọzde ga-eme ya alabị atọ kemgbe amachiri ngagharị ma nọchie ụzọ e si abanye obodo Orlu. Onye ntaakụkọ BBC ka nọkwa ebe ahụ ahụta ka o si aga nakwa etu ndị mmadụ nọ ebe ahụ si ebi. Ọ gwakwara Igwe obodo ahụ okwu ịchọpụta ihe mere. Lee ya ebe a: BBC Igbo chọpụtara na ọpụpụ na mbata n'obodo Orlu adịghịzị mfe. O kwuru na ndị agha na ndị uweojii nọchiri ebe niile iji kwụsị ndị mmadụ ọpụpụ na mbata. Ihe ọzọ bụ na mmachi ngagharị nke gọọmentị steeti ahụ ka dị mana o nweghi onye ma mgbe ọ ga-ebi. O kwukwara na rue ụbọchị taa, ụda egbe ka na-ada n'obodo ahụ Ụjọ ka ji ndị mmadụ ịpụta mbara Orlu tọgbọọ chakọọ tata dịka ndị mmadụ n'eze isi onwe ha. Nsogbu ahụ dapụtara n'etiti ndị ọrụ agha na ndị Ipob n'Orlu, Imo steeti ka na-agakwa n'ihu ugbua. BBC chọpụtara na okporo ụzọ nakwa obodo dị iche iche n'Orlu dịka Amaifeke, Okporo na Banana junction dịka ebe agbara ọsọ n'ọdụ ahịa, ụlọ akwụkwọ na ụlọ ọrụ niile gbachiri agbachi. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu ekwuola na ụfọdụ mmadụ pụtara ụnyahụ bụ Jenụwarị 26,2021 wakpoo ogige ndị Hausa bi n'Orlu ma gbuo ndị agha anọ. O kwuru na nke a mere ka ndị agha wuchie ebe ahụ . Ọ gara n'ihu kwuo na ya ejichaghị akụkọ zuruoke gbasara ya bụ mkpa mkpa kpara n'Orlu ụnyahụ. O kwuru na ka ihe si kwụrụ n'ụtụtụ a, udo alaghachitela ebe ahụ dịka ụfọdụ ndị otu ya nọ ebe ahụ ugbua. Orlando kwuru na mmachị ngagharị ka dị n'Orlu ugbua. Anyị ka na-ege ntị ịnụta n'ọnụ ya gbasara ọdachị a. Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu etinyela ọnụ n'okwu gbasara ihe na-eme n'Orlu ma kwuo na ""Orlu agaghị abụ Obigbo ọzọ"". O ji Obigbo nke dị na Rivas steeti ebe echeere na ndị agha gburu ndị mmadụ n'ụzọ ezighi ezi were amaatụ n'ihe na-eme n'Orlu. O kwukwara na ọ ga-aga n'ihu ị me ihe ọ na-eme rue mgbe akpọrọ ya oku na ""Hague"". Hague bụ ebe ụlọikpe kachasị na-ekpe ndị omekome n'ụwa niile ikpe nọ, ọ dị na mba Netherlands. ""Nwụchie nu ndị aka ha dị n'ọgbaghara a"" - Hope Uzodimma Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma etinyela mmachị ngagharị n'obodo Orlu dịka ọgbaghara dapụtara n'ebe ahụ. Amabeghi mgbe mmachi a ga-ebi mana o ga-esi n'abalị rue n'ụtụtụ. Uzodinma n'ozi ziputere kwukwara na obi adịghị ya mma maka ogbugbu na ọgbaghara ahụ dapụtara. O zikwara ndị ọrụ nchekwa ozi ka ha nyoo anya n'ala chọpụta ndị aka ha dị n'ogbugbu a. Ebe ndị mmachi a metụtara bụ Ihe anyị ma maka ihe na-eme n'Orlu Akụkọ na-efegharị na-ekwu na ndị nọ n'Orlu agbaala ọsọ ndụ dịka otu amaghị ndị ha bụ na ndị echere na ha bụ ndị agha Naịjirịa na-akwa mgbọ. Otu onye nọ ebe ihe mere aha ya bụ Chimezie kwuru na ọ gbapụrụ na be ya gbalaga obodo ọzọ dị nso n'ebe ahụ. O kwuru sị ""ụzọ abụọ banyere n'ime ogbe ebe m bi bụ ndị agha nọchiri ya, ha hiri nne ju ebe niile"" Onye ọzọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ bụ Precious kọwara ihe anya ya hụrụ n'ụzọ Orlu taa. O kwuru na ọ nọ n'ụzọ a ga Orlu mgbe mmadụ ụgbọala anọ bụ ndị mmadụ na-agbali egbe elu zutere ha n'ụzọ. O kọwara na mmadụ niile nọ n'ụzọ ahụ gbahapụrụ ụgbọala ha mgbe ha hụrụ ihe na-eme. Precious kwukwara na ọ maghị otu bụ otu ahụ na-agbli egbe elu. Mgbe BBC kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu, o kwuru na ọ nọ na nzụkọ ma sị anyị kpọghachi ya. Kedụ etu ọgbaghara a si bido? Otụ onye na-achoghi ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na oruola izu ụka abụọ ọ bidoro ịhụ ụmụ okorobịa bu ngwa ọgụ na anọkari n'ime ụgbọala na-agbali egbe elu ka ha na-agbafe n'orlu. Ọ kwuru na ndi a na-eyikari uwe ojii na okpu na-achaa mmemmé. Ha nwere-ike ịbụ ụgbọala Sienna, hilux maọbụ jeep. Ọ kwuru na ndị a anaghị achọ ndị obodo okwu kama ha na-awakpo onye ọrụ nchekwa Obula ha hụrụ n'ụzọ. Ọ kwukwara na egbe nke a gbara taa na ha gbara ya gbatee ya aka. Ọ kwuru na enweghị onye ma ndi ha bụ. Ọ kwuru na ụbọchị olee gara aga ka ndị agha gara obodo ụmụtanze bụ ebe ndị a si aputa, were nwuchie ma gbuo kwa ụfọdụ ụmụ okorobịa ha jidere. Kama ọ kwuru na ọ bụghị ndị a ka ndị agha ahụ jidere. Ọ kọwara na ndị agha gbara keke ụfọdụ ndị mmadụ ọkụ dika ndi agha na-ekwu na egburu otu onye otu ha n'obodo ahụ. Onye akaebe a kwuru na ndị nọ n'obodo Umutanze agbaala ọsọ ndụ ha. Ma sikwa na ya bụ ogbaaghara na ha abanyela obodo ndị ọzọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56114162 +business Yam Farming: Lee ihe mere ịkọ ji n'akpa ji dị mma karịa ịkọ ya n'ala Sunday Obi-Chukwu, onye ọrụ ugbo kọwara ka o sị malite ịkọ ji n'akpa nakwa ihe mere oji na-akọ ya n'akpa karịa n'ala. Na njem BBC Igbo mere n'ọrụ ugbo ya, o mere ka a mata na ịkọ ji n'akpa n-enye aka ịkọpụta ọtụtụ ji n'okeala karịa mgbe a kọrọ ya n'ala. Ọ sị na ihe mere o jiri malite ya bụ n'ihi oke nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo na Naịjirịa nke buterela ọnwụ ọtụtụ mmadụ. Obi-Chukwu sị na uru ọzọ dịka n'ịkọ ji n'akpa bụ na ọ naghị abọchasị ahịhịa ọbụla mana ị kọọ ji n'ala na ị ga na-abọchasị ahịhịa kwa mgbe. Kirie ihe o kwuru n'uju; Ndị mere akụkọ a bụ Ikechukwu Kalu na Nnamdi Agbanelo https://www.bbc.com/igbo/afirika-58566129 +sports AFCON 2019: Họrọ ndị i che ga-agwọ ibe ha ka abacha . https://www.bbc.com/igbo/afirika-48701343 +entertainment Chiwetalu Agu apụtala n'aka ndị DSS "Omeiheonyonyo bụ Chiwetalu Agu apụtala n'aka DSS kpụ ya gawa Abuja. Ọ bụ otu ndị na-enye ihe onyonyo bụ AGN nwara ịgbapụta ya ma mee nke a. N'ozi ndị AGN wepụtara ha kwuru na Agu kelere chukwu ma kelee ndị otu AGN maka enyemaka ha n'ịzọpụta ya. Foto Monalisa Chinda weputara n'akara Instagram ya gosiri ebe Chiwetalu Agu nọ n'etiti ya na Steve Eboh ma yiri uwe ojii. Cheta na BBC chọpụtara na ndị DSS ji Chiwetalu Agu akpụrụla ya gawa Abuja. Omeiheonyonyo bụ Steve Eboh kọwaara BBC nke a mgbe akpọtụrụ ya ịmata ka ya na okwu ahụ si aga. O kwuru sị na ha gara ịleta Agu n'ebe ndị DSS ji ya mana ha gwara ya na eburu la Agu gawa Abuja. ""Anyị bụ ndị AGN na-akwado ịga Abuja mara ihe mere e ji kpụrụ Agu gawa ebe ahụ"" ka o kwuru. Mgbe anyị jụrụ ya maka ebubo ndị DSS boro Agu mere ha ji jichie ya ọ sara si na ""o dobeghi anya"". ""O nwegbeghi ihe DSS boro ya, anyị na-achọ ịma ihe eji jichie ya mbụ tupu ihe ọzọ"" ka Eboh kwuru. Cheta na BBC Igbo kwuru na DSS ka ji omeiheonyonyo Agu n'agbanyeghị akụkọ na-efegharị na atọghapụla ya kpamkpam. Nwa amadị a si n'aka ndị agha Naịjirịa banye n'aka ndị ""Department of State Services"" (DSS) n'ụbọchị Fraịde. Ndị otu ya gwara BBC Igbo na ngalaba ahụ sị na ya chọrọ ịgba ya ajụjụ ọnụ. Ha sịbụ na ha chere na ọ bụ otu awa ka o ga-anọ ebe ahụ mana ha mechakwara sị na ha na-achọ na onye ọkaiwu nwere agba ga-abịarịrị binyere ya aka tupu ha ahapụ ya. Steve Ebo bụ onye na-ahụ maka ihe banyere mmekọ ndị agha Naịjirịa na otu ndị na-eme ejije bụ Actors Guild of Ngeria (AGN) kwuru na DSS na Maazị Agu nọ na mkparịta ụka ya na BBC Igbo n'ehihie Fraịde. Maazi Ebo e ji Ajebo mara gwara BBC Igbo na ahụ dị Chiwetalu. Ọ sị na ndị agha sị na ha ma ụma kpọpụta Chiwetalu ebe o yi akwa yiri nke ndị Ipob eke buredi n'Upper Iweka. O kwuru na ndị agha kwuru na ha amaghị ihe kara ime ebe ahụ ma ọ bụrụ na ha akpọpụtaghị ya mgbe ahụ dịka ọnọdụ dị njọ n'Onitsha ugba. Ọ sị: ""anyị agbapụtala Chiwetalu n'aka ndị agha Naịjirịa. Ndị agha etighị ya ihe ma ọlị. Ugbua anyị apụtala n'aka ndị agha, anyị nọzị n'aka ndị DSS ugbua maka nnyocha nke ha"". O kwuru na Chiwetalu nọ n'ọzọ mgbe e jidere ya, na ọ ga-alọghachi azụ n'ọlụ ma ọ opụta n'aka nd�� DSS. Lee akwụkwọ ozi ndị otu AGN ziputere maka nke a. Cheta na ndị agha Naịjirịa nwụchiri Maazị Agu n'Ọnịcha ụnyaahụ ma boo ya ebubo na ọ na-akwado otu Indeginous People of Biafra (Ipob) na Eastern Security Network (ESN). Ndị agha bugara Chiwetalu Agu n'ogige ha bụ 82 Division dị n'Enugwu bu ebe e si gbapụta ya ugbua. Onyeisioche Actors Guild of Nigeria mpaghara Enugu bụ Brown Ene gwara BBC Igbo na ya nọ n'ụzọ ịga ebe Maazị Agu nọ ugbua. Ọ bụ ya gwaburu BBC Igbo na e nwereike ịtọhapụ Maazị Agu taa. Ọ sị na ya ga-atụnye anyị azụ dịka ha na-aga n'ihu. Ihe onyonyo ọhụrụ pụtara na-egosi ebe Chiwetalu Agu nọ n'aka ndị agha Naịjirịa na-akọwa na akwa ya yi abụghị akwa Biafra ma ọbụ ESN. Ọ sị na ya bụ akwa bụ afe nkịtị esere anyanwụ na-awa awa, ""ọ bụghị afe Biafra ma ọ bụ ESN"". Mgbe ha sị na ọ kpọkọtara ndị mmadụ na-agwa ha okwu, ọ zara na ọnweghị onye ya kpọrọ kama na ya gotere achịcha bekee ya na-eke ndị mmadụ. Ọ sị ""e gotere m bụredi puku iri naanị m kere ndị mmadụ. Ọ bụ arụ ike ndị mmadụ ihe?"" Ndị agha ahụ jicha egbe emetughị ya aka, mana ha si ebe ha tukwuwere ya ala kpọrọ ya bawa ụlọ. ""Ọ bụ maka na Chiwetalu Agu na-ajalite ndị mmadụ mmadụ ma na-akwado otu IPOB kpatara anyị ji nwuchie ya."" Nke a bụ ihe Onyema Nwachukwu, bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa kwuru banyere nnwuchi ndị agha nwuchiri Mazị Chiwetalu Agu bụ onye a ma ama na-eme ihe ejije Nollywood. N'akwụkwọ ozi nke Onyema Nwachukwu wepụtara n'abalị Tọzde, o kwuru na IPOB bụ otu a machiri amchi dịka ndị oyi egwu na Naịjirịa. ""Onye ọbụla na-akwado IPOB na-ama ikike Naịjirịa aka n'ihu,"" Onye Nwachukwu depụtara. ""Ọzọkwa bụ na ọ na-eme nke a n'agbanyeghị etu ọnọdụ nchekwa siri dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ugbua."" ""Tinyekwara atụmatụ nchekwa nke ndị agha na-eme a kpọrọ 'Exercise Golden Dawn."" ""Anyị anwụchiela Chiwetalu Agu ugbua dịka nnyocha ka na-aga n'ihu."" Ọnụ na-ekwuru ndị agha kwuru na onweghị mgbe ndị agha jiri mekpaa Chiwetalu Agu ahụ dịka ọtụtụ akụkọ na-ekwu. Onye Nwachukwu gara n'ihu kwuo na ndị agha Naịjirịa agaghị agbachi nkịtị ka ndị IPOB nakwa ndị nkwado ha na-ebute enweghị nchekwa na Naịjirịa. Ọ gwara ndị mmadụ ka ha ghara ịtụ ụjọ ọbụla kama ka onye ọbụla na-agara mkpa ya ma na-edebekwa iwu obodo. Onyeisi otu Actors Guild of Nigeria bụ Emeka Rollas ekwuola na ha amalitela nnyocha n'ihe mere n'etiti Chiwetalu Agu na ndị agha Naịjirịa. Onyonyo pụtara na soshal midia taa gosiri ebe Chiwetalu Agu na ndị Agha nwere nghọtahie nke mere ka ha dọọ ya na-akwa ma buru ya eburu bupu. Onwebeghị onye ma ihe kpatara nke a, mana onyonyo ahụ gosiri na Chiwetalu yi uwe e ji ọkọlọtọ Biafra kwaa. Oge BBC Igbo kpọrọ Emeka Rollas, o kwuru na ya ahụla onyonyo ahụ mana nnyocha amalitela. ""Ezigala m onye enyemaka m n'okwu gbasara ndị agha ka ọ gaa jụta ihe merenụ kpọmkwem,"" Rollas kwuru. ""Anyị amaghị ma uwe ahụ Chiwetalu yi ọ bụ ejije ka o ji ya eme ka ọ bụghị."" ""Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ihe edobeghị anya, mana anyị ga-achọpụta ma zighachitere ụnụ ozi."" Gịnị mere n'etiti Chiwetalu Agu na ndị agha Ihe onyonyo BBC Igbo hụrụ gosiri ebe ndị agha Naịjirịa na-adọ onye Chiwetalu Agu aka n'akwa. Onyonyo a yiri ihe e sere na mpaghara Ụpper Iweka dị n'Ọnịcha. Maazị Agu bụ onye ejije Nollywood ama ama na-egosi onwe ya n'onyonyo ebe oyi uwe e ji ọkọlọtọ Biafra kwaa. BBC Igbo na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ Maazị Agụ. Ọnụ na-ekwuru ndị agha Navy n'Ọnịcha bụ Lt Ajikobi gwara BBC na ya anọghị Ọnịcha ugbua, nke mere ya amaghị maka ihe mere. Dịka onyonyo a gosiri, ọ dịka ndị agha emechara hapụ Maazị Agu. Cheta na Chiwetalu Agu na-eyikari uwe ọkọlọtọ Biafra na-ese foto ma na-etinye na soshal midia. Oge ọbụla, ọ na-ekwu na Biafra bụ ""atụmatụ oge ya ruru""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58828236 +health Malaria: Ụzọ asaa ị ga-esi gbalahụ ọnwụ site n'ọgwụanwụ "Ọgwụanwụ na-egbu anwụnta na-ebute ọrịa ịba mana i were iwe anwụnta hapụ ime etu o kwesiri n'ihe gbasara ịchụ anwụ, ụchịcha na, ahụhụ ndị ọzọ, inwere ike hapụ igbochi ọrịa goro ọnwụ. Na nsonso a, Ghana ebe ụmụaka atọ gụnyere ejima dị ọnwa itoolu nwụrụ ka ha kuruchara ọgwụanwụ ndị mụrụ ha gbara n'ụlọ ha. Ọkachamara n'ihe gbasara ahụike ọha na ụlọọgwụ Lagos University Teaching Hospital(LUTH) bụ Dọkịta Ezekiel Oridota kwụrụ na emeghị ọgwụanwụ ka o kwesiri nwere ike ibute nsogbu dị icheiche dịka mgbaka akpụkpọahụ,ụkwara,azụzụ, ọrịa ebe e si eku ume na ọnwụ. Lee ụzọ ise ị ga-esi gbalahụ iji aka gị gbuọ onwe gị ebe n'achụ anwụ: Ogwụanwụ ndị na-enyekarị nsogbụ na-abụkarị ọgwụ ndị ọrụugbo ji echekwa mkpụrụ ha kọrọ ka ọ ghara ịgba ụtụ. Ebe ụfọdụ bụ ọgwụanwụ gọọmentị mabidoro n'iwu mana ndị mmadụ gara n'ihu were ya egbụ ahụhụ. Dọkịta Oridota dọrọ ndị mmadụ aka na ntị sị""Gba mbọ gụọ ihe e dere n' ahejiri mee ọgwụanwụ ịtupu ịzụ ya."" 2.Zụụ naanị ọgwụanwụ e jiri flawa mebe Dịka Dkta Oridota siri kọwaa, ọgwụanwụ ndị na-egbukarị ndị mmadụ bụ ndị nwere chemịcalụ a kpọrọ 'organophosphosphate' nakwa 'carbamate'. Ọ sị: ""Gbara ọgwụanwụ nwere chemicalụ ndị a na-akpọ 'organophosphosphate' nakwa 'carbamate' n'ihi na ihe ahụ dị n'ime ha mere ka ha na-egbunwu anwụ, ụchịcha na oke nwekwara ike igbụ mmadụ."" 3. Yiri ihe n'aka na ị na-agba ọgwụanwụ Ọgwụanwụ nwere ike ikuba n'ọnụ,n'imi nakwa metụta gị n'ahụ na ị na agba ya. Iji gbochi nke a, Oridota nyere ndụmọdụ ka ị yiri ihe n'aka, n'elu imi nakwa n'arụ gị oge ị na-agba ọgwụanwụ. 4. Nye ohere tupu ịlabanye n'ụlọ ị gbara ọgwụanwụ Nyee ogologo oge iji chere ka ọgwụanwụ kusasịa tupu ịbanye hiee n'ụlọ ị gbara ọgwụanwụ. Oridota dụrụ ọdụ ka, ""Mepe windo gị na ma chee ogologo oge ma ịgbacha ọkwụanwụ tupu ịlaba ụra."" 5. Edowela ihe oriri maọbụ ihe ọṅụṅụ na okpokoro ejibu tinye ọgwụanwụ Ụfọdụ na-asa okpokoro ha ji debe ọgwụanwụ na kemikalụ ndị ọzọ were tinye mmanụ, mmiri na ihe ndị ọzọ a na-etinye n'ọnụ. Oridota kwuru: "" Onwela ndị nwụrụ site n'ime ụdị ihe dị otu a."" 6. Edowela nri, mmiri n'ebe ị na-edewe ọgwụanwụ Oge ụfọdụ ndị mmadụ na hapụ nri na mmiri ha oghere mee ka ọgwụanwụ na hibanye na mmiri na nri a na-eri eri. Oridota kwukwara mkpa ọ dị ikuziri ndịọrụugbo ụzọ ha ga-eji chekwaa ihe ha kọrọ na-ejighị ajọ ọgwụ nwere ibanye na nri. 7. Jiri akwa mgbochi anwụta chụọ anwụ Dịka ọkammụta Oridota siri kwuo, "" Irahụ ụra n'ime akwa mgbochi anwụnta bụ ụzọ kachasị mma igbochi ọrịa anwụta."" Gee ihe Dkta Oridota kwuru na bekee:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-43876261 +business "Orlu Timber Market: ""Ọ bụghị gọọmentị Imo ka ọ dịịrị ịza ajụjụ mmechi 'timber market'" Kọmịshọna mgbasaozi n'Imo Steetị bụ Declan Emelumba sị na 'ọ bụghị gọọmentị Imo ka ọ dịịrị ịsa ajụjụ mmechi a sị ndị agha mechiri 'timber market' dị n'Orlu. O kwuru nke a mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ya iji nụrụ ihe gọọmentị nwere ikwu maka mmechi ọdọahịa ahụ kamgbe Tuzde. Ọ sị ka a jụọ ndị agha ihe mere ha jiri gbachie ụlọahịa ahụ ma ọ bụrụ ha gbachiri ya n'ezie okwu. Mana cheta onye ntaakụkọ BBC Igbo gaara n'ọdọahịa osisi dị n'Orlu ma chọpụta na ọ ka gbachiri agbachi ruo ugbua dịka ndị agha Naijirịa mechiri ya n'ụbọchị Tuzde. O kwuru na ọ hụrụ ụfọdụ ndị ahịa nọ ebe ahụ ka ha nọ n'ụjọ. Ndị agha mechiri ọdọ ahịa akụrụngwa eji arụ ụlọ abụọ nọ n'Orlu kama ha mechara nye ndị nke ọzọ ikike imepe mana ha ekweghị ka ndị nke na-ere osisi meepee. Otu onyeisi ahịa nke ọzọ gwara BBC Igbo na ọ bụ maka ụda egbe a gbara n'ahịa n'ụbọchị Mọnde mere ndị agha jiri gbachie ahịa abụọ a. Ọ gara n'ihe kwuo na ọ bụ mgbe ndị agha chọpụtara na ọ bụ n'ahịa ndị na-ere osisi ka a gbara ya bụ egbe mere ha jiri nye ha ikike imepe. Dịka ọ dị ugbua, ahịa ndị a na-ere osisi bụ ọgbọ osisi ka mechiri emechi. N'aka nke ọzọ, ka akụkọ na-ekwu na ọtụtụ ndị ahịa ekweghị ịmepe ụlọahịa ha n'ụbọchị Mọnde iji kwado Nnamdi Kanu dịka a kpere ikpe ya n'Abuja n'ụbọchị Mọnde ahụ. Ya bụ akụkọ na-ekwu na ọ bụ ihe ndị ahịa a mere kpasuru ndị agha iwe ha jiri sị ha emepela ahịa n'ụbọchị Tuzde. https://www.bbc.com/igbo/afirika-57994534 +entertainment Ụzọ ise egwu si enye aka na mwulite ụbụrụ ụmụntakịrị "Nnyocha sayensị egosila na egwu na-enyere ụmụntakịrị aka na mwulite ụbụrụ ha, ọbụladị oge ha ka nọ n'ime afọ nne ha. Dịka ndị ọkachamara sayensị si kwuo, nwa rurula ọnwa asaa maọbụ asatọ n'ime afọ, amalitela ịnụ ihe nke ọma, ma nwekwaa ike ịmata olu nne ya. N'otu nnyocha, a chọpụtara na egwu dị ụtọ ma dịkwa nwayọọ nwereike ime ka nwa nọ n'ime afọ nọdụ jụụ. Dr Ibrahim Balatagi, ọnye bụ ọkammụta na nkuzi egwu na Mahadum 'Lebanese American University, gwara ngalaba Unicef na nwata na-amalite ịnụ ihe n'izuụka 16 ruo 18 nke afọ ime. ""N'ebe izuụka 24, ntị ya emepeela nke ọma nke na o nwere ike ịtụgharị isi ya ma ọ nụ olu maọbụ mkpọtụ mmadụ,"" Dr Baltagi kwuru. ""Ige egwu, ọkachasị egwu na-ada nwayọ nway���, na-enyere nwaanyị dị ime aka ka ahụ jụọ ya oyi, mana ọ kacha enyere nwata e bu n'afọ aka maka mwulite ụbụrụ ya."" Lee ụzọ ise egwu si enyere ụmụntakịrị aka: Egwu na-enyere ụmụntakịrị aka ịmụta asụsụ ngwangwa. Nke a bụ maka na dịka egwu ahụ na-akpọ ugboro ugboro, nwatakịrị ga-eso ya na-agụkwa ugboro ugboro. ""Mgbe nwatakịrị na-ekwu otu ihe ugboro ugboro, ọ na-amụtawanye ihe ahụ ngwa ngwa,"" Alys Mathers kwuru. Alys Mathers bụ ọkachamara n'ịnyere ụmụaka aka n'ikwu okwu na ịmụta asụsụ, nke a na-akpọ 'speech and language therapist'. Inwe mmasị ige egwu na-eso ụmụntakịrị apụta ụwa, nke a mere na ụmụaka na-achọ ilele, ige nakwa ime ihe ha hụrụ mmadụ na-eme ma ị na-agụrụ ha egwu. Dịka ha na-eme nke a, ha ga na-echeta okwu niile dị n'egwu ahụ, ma na-amụtakwa etu e si etịnye uchu na mmụta. ""Alys Mathers kwuru sị: ""dịka mmadụ na-agụ egwu, ọbụladị ụmụnatkịrị ga na-amụta usoro nakwa ụda etu egwu ahụ si ada."" ""Nke a mere iji ahụ ebe ha na-achọ imepụta ụda dị icheiche nke ha na-anụ. N'ụzọ dị otu a, ha na-amụta etu mmadụ na ibe ya si ekwukọrịta okwu."" Dr Ibrahim Balatagi kwuru na ịkụziri nwatakịrị etu e si akpọ ngwaegwu nwereike iwulite mmụta mgbakọ na mwepụ n'ime nwata ahụ, ma mekwaa ka akara ha na-enweta n'ụlọ akwụkwọ gbalie. Ụfọdụ nnyocha gosikwara na ige egwu na ịmụ etu e si akpọ egwu na-enyere ụmụntakịrị aka ịmụta 'mathematics' ""Egwu dị nwayọ dịkwa nro na-enye aka wetulata otiti obi ụmụaka ma mee ka ha na-eku ume nke ma rahụọ ụra nke ọma,"" Dr Ibrahim Balatagi kwuru. ""Nne maọbụ nna maọbụ onye na-eleta nwa ịgụrụ nwatakịrị ego dị ezigbo mkpa, maka na nwata ahụ amatala olu ha, nke na-eme ka obi jụọ ya oyi ngwangwa ọ nụrụ olu ha."" Ịrahụ ụra nke ọma na-enye nnukwu aka na mwulite ụbụrụ nwatakịrị. Nnyocha egosila na nwata na-arahụ ụra nke ọma na-aka eme nke ọma n'ihe dị icheiche n'ụlọakwụkwọ. Egwu na-eme ọtụtụ mmadụ obi aṅụrị, mana ọ kacha eme ụmụaka obi aṅụrị. Ndị ọkachamara sayensị na-ekwu na egwu dị ụtọ na-eme ka ụbụrụ mepụta 'dopamine'. 'Dopamine' bụ ihe na-ebulite mmụọ mmadụ ma mee ka ọ na-enwe aṅụrị. Egwu na-enye aka iwulite n'ime ụmụaka mmụọ mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Nke a bụ maka na ọtụtụ oge, ịgụ egwu na ịgba egwu na-abụkarị ihe mmadụ abụọ maọbụ karịa na-eme, nke a na-enye aka ịkụziri ha na mmekọ mmadụ na ibe ya bụ ihe dị mkpa. Ịgụ egwu na ịgba egwu na-enyekwara ụmụntakịrị aka imegharị akụkụ ahụ ha dị icheiche. Dịka ha na-agụ egwu, ha ga na-agba egwu, maọbụ na-akụ aka, maọbụ na-awụli elu. Ihe ndị a na-enyere ahụike ya aka." https://www.bbc.com/igbo/articles/cv27elygq1jo +religion Rev Prince Chukwuma: Ihe mere m ji akuziri ma na-akwado ụmụbọị Ụkọchụkwu Prince Chukwuma sị na ya malitere ịkpọkọ ụmụ bọyị na Nnewi ka ya hụchara ajọ agwa ha na-akpa na ka e sị achụla ha. Ọ sị na ọ bụ mgbe ahụ ka o ji metu ya n'ahụ ịmalite ya bụ nzụkọ ụmụbọị pụrụiche nke gbanwegoro ọtụtụ ụmụ ahịa ahụ. Lee ka o si malite na ebe ọ na-aga. Ọrụ a si n'aka Chioma Obianinwa, Jessica Nwankwo na Nnamdi Agbanelo https://www.bbc.com/igbo/afirika-58150349 +business Abịa state roads: “Ngwa ngwa a rụrụ ụzọ, a ga-enwe mmepe akụnaụba.” Ụkọchukwu na-achịkọta ụka Metọdist nke 'Ụmụogele Circuit' dị na dayọsis Aba-East bụ Acha David Okechukwu, kọwara BBC Igbo ihe mere ya na ndị ụka ya gaa tie mkpu maka ọnọdụ okporoụzọ Ohanku n'Aba. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52998280 +business ‘Mmadụ ise nwụrụ n’ọgbaghara nke ahịa Dei Dei, Abuja’ – Minista na-elekọta Abuja "Ndị uweojii n'Abuja etinyela ọnụ n'okwu ọgbaghara dapụtara n'ahịa Dei Dei nke Abuja n'ụbọchị Wenezde. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjịrịa n'Abuja bụ Josephine Adeh kwuru: ""Ndị uweojii Naịjirịa na-esi imi n'ala ugbua ịma etu ọgbaghara a siri dapụta n'ezie dịka anyị na-enyo ima kpọm kwem ihe ndị a kụkasiri ma mebie n'ebe ahụ"" ""Anyị na-agba mbọ ịhụ na udo anyị weghachịtere n'ebe ahụ nọdosiri ike"" ""Anyị ga-ezịpụta ozi banyere mpụtara nnyocha a n'oge adịghị anya"" Minista na-elekọta Abuja bụ isi obodo Naịjirịa bụ Mohammed Musa Bello ekwuola na ọgbaghara ahụ tara isi mmadụ ise nke gụnyere nwaanyị ahụ a sị na ụgbọala riri elu. O kwuru: ""Ọgbaghara ahụ dapụtara n'ahịa Dei Dei n'ụbọchị Wenezde tara isi mmadụ ise nke gụnyere nwaanyị ahụ ụgbọala riri elu."" ""E nyela m iwu ka agbachie ahịa Dei Dei ugbua ruo mgbe eweghachitere udo n'uju ebe ahụ."" Otu onye agbara ngwa ahịa ha ọkụ gwara BBC Igbo sị: ""Anyị achọghịzị ka ndị Okada na-agba ebe a maka ọgbaghara ha na-ebute"" ""Anyị chọrọ udo, anyị achọghị ọtụtụ"" Nwaanyị ọzọ n'ebe ahụ kwukwara ""Ngwa ahịa anyị niile gbara ọkụ, anyị gbazị aka, enweghịzị ebe anyị ga-esi nweta ihe oriri"" ""Biko bịanụ gbatara anyị ọsọ enyemaka"" Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ gbata gbata na-emenyụ ọkụ ka nọ n'ahịa a emenyụ ya bụ ọkụ ma ekpọpụta ure ure so ọgbụgba ọkụ ahụ. Cheta n'akụkọ pụtara n'ụbọchị Wenezde n'ọgbaghara dara n'ahịa Dei Dei nke Abuja bụ ebe a na-ere osisi na ngwa ahịa ndị ọzọ eji arụ ụlọ. E kwuru na ọgbaghara so ọnwụ otu nwaanyị dapụrụ n'ọgba tum tum maka etu onye ọkwọ ya bụ ụgbọ siri nyagharịe nke mere ụgbọala ọzọ jiri rie ya bụ nwaanyị elu. E kwuru na ndị nọ ebe ahụ ji iwe gbaa ya bụ ọgba tum tum ọkụ nke mere ọkwọ ọgba tum tum ahụ jiri kpọọ ndị ọzọỌgbaghara dapụtara n'ahịa Dei Dei nke Abuja akpatala nkụsa nakwa ọgbụgba ọkụ ọdụahịa nakwa ngwaahịa ndị mmadụ n'ahịa ahụ. Dịka ndị nọ ebe ahụ na-achọghị ka akpọọ aha ha siri kwuo, ha kọwara BBC Igbo na ya bụ ihe malitere mgbe agbara ọgba tum tum otu onye Okada ọkụ n'ihi nyagherị ọ nyara mere nwaanyị o bu n'azụ jiri dapụ. E kwuru na ụgbọala gwongworo na-agafe ebe ahụ riri nwaanyị ahụ elu nke mere o jiri nwụọ. Ka e si kwuo, ndị nọ ebe ahụ ji iwe gbaa Okada ahụ ọkụ nke mere ya bụ onye Okada jiri gbapụ ma gaa kpọkọta ọtụtụ ndị otu ya. E kwuru na igwe mmadụ ndị Okada ahụ bịara ịbọ ọbọ n'ihe a ji osisi nakwa ngwa ọgụ ha pụta ma kụsasiwa ụgbọala na ngwa ahịa ndị nọ ebe ahụ. Otu onye agbara ngwa ahịa ọkụ kwuru: ""Ha pụtara ma malite imaja ndị nọ ebe ahụ"" ""Igwe mmadụ ndị Okada ahụ gbara ngwaahịa m niile ọkụ"" Ka o dị ugbua, a na-eche na ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị Igbo na ndị awụsa bi ebe ahụ. Ọtụtụ ihe onyonyo nke BBC Igbo natara gosiri ebe ndị ntorobịa na-ebe akwa dịka ndị bu osisi na-agba ụlọ ahịa ha ọkụ. Olu onye na-ese ihe onyonyo ahụ kwuru n'asụsụ Igbo 'Lee ndị a na-agba ọdụahịa ndị mmadụ ọkụ, chai, ego ndị mmadụ alaala ebe a'." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61472197 +politics Herders-farmers conflict: Ihe mere Gov Ikpeazu ji kwụọ ndị ọchịehi ụgwọ "Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia Steeti ekwuola na ihe mere o ji nye ndị ochi ehi ego bụ ka udo chịa n'Okpuru Ọchịchị Ụkwa-East dị na steeti ahụ. Nghọtahie dara n'etiti ndị ntorobia na ndị Fulani Ọchịehi na Ukwa -East nke mere ka ha gbuo otu ehi onye ọchịehi. Mana gọvanọ Ikpeazu site n'ozi si n'ọnụ onye odeakwụkwọ mgbasaozi bụ Onyebuchi Ememanka gwara BBC Igbo n'ekwentị na ịkwụ ụgwọ ehi abụghị n'ihi egwu kama ọ bụ iji gbochie tigbuo-zogbuo n'etiti ndị mpaghara ahụ na ndị Fulani ọchiehi. Ihe onyonye pụtara na soshal midia gosiri ebe onye a kpọrọ Sam Nwogu n'aha gọvanọ Ikpeazu nyere otu onye Eze ego dị otu puku narị naịra na iri asa n'Ụkwa East. Ego a bụ nke Nwogu kwuru na o si n'aka gọvanọ bụ maka iji kwụọ ndị ọchiehi ụgwọ n'ehi ha ndị ntoroọbịa obodo ahụ gburu. Ndị nọ n'obieze mgbe nke a mere gụnyekwara onyeisioche okpuruọchịchị Ụkwa East bụ O. C Nwanuo. Onye Eze were ego a nyefee onye na-anọchite anya ndị ọchịehi n'aka ma gwa ya ka ọ dọọ ndị nke ya aka na ntị ka ha ghara imebi ọrụụgbo ndị obodo ọzọ. Agwa a gọvanọ kpara butere nkatọ si n'ọnụ ọtụtụ ndị mmadụ ndị kwuru na ọ na-akwado ndị ọchịehi n'Abia Steeti. Mana Ememanka kwuru na ego a gọvanọ Ikpeazu nyere bụ iji mezuo nkwa o kwere n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo maka ime udo n'Abia Steeti. O kwuru na ọ bụghị maka ịtụ egwu kama na ọ bụ ka udo dị n'etiti ndị obodo ahụ na ndị ọchịehi. N'okwu ya ""Kama a ga-ekwe n'ihi ehi gbuo mmadụ, nye ndị a ego a ka ha gawa."" ""Ọ bụghị n'ihi ịtụ ụjọ, kama ọ bụ amamihe ka e ji achị steeti.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48862331 +sports Enyimba na Abia Warriors: Kedụ ihe na-esere ụmụnne abụọ? "A na-ahụta otu egwuregwu bọọlụ Enyimba na Abia Warriors dịka ụmụnne n'ihi na ọ bụ otu gọọmentị Abia Steeti na-akwado. Mana mgbe ọbụla ha abụọ zutere n'asọmpi NPFL ọ na-adị ka ebe agụ abụọ na-alụ ọgụ, etu o si dị n'ụbọchị Sọnde. Otu egwu bọọlụ abụọ nọ na-agba bọọlụ n'ọgbọegwuregwu dị n'Umuahia mgbe ndị nkwado ha malitere mawa ibe ha okwute. Nke a butere mmerụ ahụ ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere onyeisi ndị Enyimba bụ Felix Anyansi Agwu. Minista egwuregwu bụ Sunday Dare sị na ya na ndị isi na-ahazi bọọlụ na Naịjirịa ga-ezuko maka ọgbaghara dara n'etiti Enyimba na Abia Warriors n'ụbọchị Sọnde. Onye na-ekwuchitere ndị otu Abia Warriors bụ Chigozie Nwosu kọwara etu ha sị huta ihe mere. Nwosu kwuru na ọ bụ ihunanaya ndị nkwado otu abụọ ndị a butere ọgbaaghara ahụ. O kwuru na dịka asọmpị na-ebido, ndị nkwado Enyimbe a na-akpọ 'Colombians' nọrọ n'akụkụ nke ha ebe ndị nke Abia Warriors a na-akpọ ""Ụmụafrịka"" nọkwa na akụkụ nke ha. O kwukwara na ọ bụ mgbe enyere ndị otu Abia Warriors penariti mana onye otu ha bụ Emeka Issac gbafuru ohere ịjị nye goolu. Mgbe ọ gbafuru bọọlụ ahụ, onye otu nkwado nke ndị Enyimba jị ọṅụ were karama plastic na-akụ onye nkwado Abia Warriors n'isi, na-akwa ya emu maka ohere ha gbafuru. Onye nke Abia Warriors si ebe ọnọ gbaga ebe ndị otu ya nọ ha were jụọ ya na onye ahụ na-akụ ya ihe n'isi ọ bụ enyi ya, ọ were sị ha mba. Ndị nke Abia warriors were iwe kụkwara onye 'Colombian' nke mere ka ndị otu ya hụta ihe na-eme wee chee na ọgụ adaala. Nwosu kwụkwara sị "" ọ bụ ndị nke Enyimba bu ụzọ tụo okwute"", nke mere ka ndị nke ụmụafrịka tụghachi kwa ya azụ. Dịka ihea na-eme asọmpị ka na a gakwa na ihu. Nke a mere ka onyeisi ha bụ Emeka Inyama na nke Enyimba Felix Anyansi Agwu bụ bilie ịrịọ ndị otu ha abụọ ka ha dere juu. Nwosu kwuru sị ""Ọ bụ onye otu enyimba chọrọ ịtụ ndị ụmụafrịka okwute na-amaghị ama were tụọ ya onyeisi ndị Enyimba"". Mgbe ha hụrụ na onyeisioche ndị Enyimba emerụọla ahụ, ndị otu Enyimba jiri iwe bata n'ogige asọmpị nke mere ka akwụsị asọmpị ahụ. O kwukwara sị "" ha mebiri otutu ihe, mwakpo kwa ọtụtụ ụgbọala, nara otu nwaanyị ego ya ,ma banye be otu nwaanyị na-ere ihe mebie ihe ma taa anụ ya na-akwụghị ụgwọ. Nwosu kwukwara sị "" anyị nụkwara na mgbe ndị Aba a na-ala, ha zukwara otutu ndị mmadụ ego"". O kwukwara na onyeisioche ha depụtara akwụkwọ were rịọ ka ndị Enyimba gbahara na ejighị ọgbaaghara mara ndị Abia Warriors. Nwosu sị na onyeisioche sị na ọ ga-ahụ ndị nkwado ha bụ ụmụafrịka ka ụ dịri ihea hapụ ime ọzọ ma sịkwa na ha nwere ike iwelite ọnụ ọgụgu ndi nchekwa n'ụbọchi asọmpi ọbụla. Ọnụ na-ekwuchitere ndị otu Enyimba bụ Samuel Zazi Bariza kwuru na ha na-akagbu ọgbaaghara n'ụzo obụla o siri bia na egwu bọọlụ. Bariza sị; ""Anyị agaghị kwa ata onye ọbụla ụta ma ọ bụ si na ọ bụ onye a bidoro ọgba aghara , n'ihi na ihe kacha mkpa bụ ikwusi ọgbaaghara n'asọmpi futubọọlụ"". O kwukwara na ihe gbasara nchekwa ama egwuregwu, "" Ọ bụ otu na-achịkọta bọọlụ bụ FA ka ọ dịrị ihụ na ama egwuregwu nwere ọnụ ọgụgụ ndị nchekwa dịka ọ kwesiri"". Ọ kwuru na ọ bụ ihe ọchi na ndị nwe ama egwuregwu na-ekwu na ọ bụ ndị mbiarambia bidoro ọgba aghara, ma ị sị kwa na ọ bụ onye otu anyị merụrụ onyeisioche anyị ahụ bụ ihe ọchị"" Kama dịka ọ sị kwuo, ""ọ bụghị maka ịta ụta, ọ bụ maka udo ị di na egwuregwu bọolụ"". Ma sịkwa sị; ""Eee anyị nwere ndị nkwadọ a na-akpọ 'Colomboians'." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51528873 +sports AFCON Group F Result: Cameroun achụpụla Guinea-Bissau ajọ mmụọ n'anya Otu 'Indomitable Lions' nke Kamerun ewerela ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie Gini Bissaụ na mmalite njem ha na asọmpi AFCON 2019. Goolu nke mbụ si n'aka Yaya Banana wee bia na nkeji 66, ebe Stephane Bahoken nyere nke abụọ na nkeji 69. Mmeri a enyela Kamerun akara atọ iji bụrụ ndị nke mbụ na 'Group F'. Kamerun na Gana ga-ezute onwe ha n'ụbọchị Satọdee abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Juun. N'egwuregwu nke ọzọ e nwere taa, otu egwu mba Gana na ndị Bene Repọblik zutere onwe ha ma were goolu abụọ gbaa onwe ha onye lawa, onye lawa. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48765903 +politics Ihe mere Nnamdị Kanu ji gbaa ngalaba DSS akwụkwọ ọhụrụ n’ụlọikpe "Nnamdi Kanu bụ onyendu otu  Indigenous People of Biafra, (Ipob) nke nọ na nga ndị DSS kemgbe afọ 2021 agbaala ngalaba ndị uweojii ahụ akwụkwọ ọhụrụ n’ụlọikpe. N’ozi ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor zipụtara na soshal midia ya, ọ kọwara na Kanu na-agba ngalaba ndị uweojii Naịjirịa bụ ‘Department of State Service’  (DSS) akwụkwọ n’ihi ha enweghị Kanu onye ndị ọkaiwu ya kwuru ahụike ya na-adatụ hụ ndị dọkịnta ya. Ejiofor onye kwuru na ikpe a nọ n’ụlọikpe ukwu nke Abuja kwuru na Kanu chọrọ ka ndị dọkịnta ya mee nnyocha ime ahụ ya iji mara ihe na-eme ya kpọm kwem mana gaa n'ihu boo ebubo ndị ọrụ DSS ekweghị ka nke a mee. N'otu aka ahụ ọkaiwu Kanu bụ Aloy Ejimakor zipụtara ozi na soshal midia ya na Satọdee na-ekwu na gọọmentị Naịjirịa ma na a chọrọ iwa Kanu ahụ ma ha jụrụ itọhapụ ya dịka ụlọikpe mkpegharị siri nye kwu. Mkpesa ọhụrụ a ndị ọkaiwu Kanu na-eme nke akara ya bụ FHC/ABJ/CS/ 2341/2022 chọrọ ""Ka e kwe ndị dọkịta ahụike ya ka ha mee nyocha ahụ ya iji mara ọnọdụ ahụike ya na-adatu ugbua, dịka Ụlọikpe ukwu nke Abuja siri nye iwu na mbụ mgbe Ọkaikpe B.F.M. Nyako, n’ụbọchị 21st nke Ọktoba, 2021 nyere ohere a dị n’akụkụ asaa  n’akwụkwọ iwu mgbochi mmekpa ahụ, 2017"". Nke a na-abịa dịka ọkaiwu Kanu Aloy Ejimakor boro ebubo na nso nso a na ndị ọrụ nchekwa DSS kwuru Kanu agụụ ruo abalị itolu dịka ọ gara njem ileta ya. Ejimakor kwuru na ndị DSS mere nke a ma jụkwa inye ya ọgwụ ya n’ihi ha sị na ha enweghị ego izụta nrị nakwa ọgwụ. Akwụkwọ ikpe a bokwara ebubo na DSS ekwebeghi rubere iwu ụlọikpe nyere ha banyere Kanu ịnata ọgwụgwọ ahụike ya isi kemgbe. Mana ọnụ na-ekwuru ndị DSS bụ Peter Afunanya gwara BBC Igbo mgbe ozi Ejimakor pụtara na ""nleta nakwa ọdịmma ndị nọ n'aka anyị bụ ihe kacha dị anyị mkpa. Anyị anaghị emekpa ndị nọ n'aka anyị ahụ ma ncha"". Mgbe akụkọ okwu ịkwụ Kanu agụụ nakwa ndatu ahụike ya gbara n'ọha, akụkọ ọzọ pụtara na ndị mmadụ bịara jiri aha Kanu nakwa ọnọdụ ike ya egwu ndị Igbo wayo ma na-akụpụta ha ego n'akpa site n'atụmatụ ịtụkọrọ Kanu ego maka nri nakwa ọgwụ. Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Mike Ozekhome etiela mkpụ ma dọọ ọha obodo aka na ntị maka ụfọdụ ndị ekperima na-eji aha ya anakọ ndị mmadụ ego na-ekwu na ọ bụ i ji nyere Kanu aka. Ozekhome kwuru nke a n'ime akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Disemba 2022. O kwuru na ọ bụ ihe mwute na ụfọdụ ndị ofeke na ndị ekperima na-eji ọnọdụ Kanu na-aghọgbu ndị mmadụ ma na-anapụ ha ego, n'aha ya onwe ya bụ Ozekhome. ""Ana m akpọku ọha obodo ka onye ọbụla mara na mụ bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu, onyeisi otu IPOB, maọbụ ụlọọrụ m, enyeghị onye ọbụla maọbụ ndị ọbụla maọbụ otu ọbụla ikike ịrịọ maọbụ ịnakọ ego n'aha m, maọbụ n'aha ụlọọrụ m, iji na-anọchite anya Nnamdi Kanu n'ụlọikpe, maọbụ iji mee ihe ọbụla. Onweghịkwanụ mgbe m ga-eme ihe dị otu a"" Ozekhome kwuru. ""Ndị niile aka ha dị na wuruwuru a ga-ezute ntaramahụhụ niile nke iwu. Anyị ga-achọ onye dị otu a ebe ọbụla ọ nọ ma nye ya ụgwọ kwesịrị ya."" Mkpu a ọkaiwu Mike Ozekhome na-abịa dịka ọkaiwu pụrụ iche nke Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor kwupụtara na ndị ọrụ nchekwa 'Department of State Service' (DSS) anaghị enye Nnamdi Kanu nri n'ụlọ mkpọrọ. Ejimakor kwuru na ya na nwanne Nnamdi Kanu bụ Emmanuel Kanu gara leta ya n'ụbọchị Tọzde, ha wee hụ na o ribeghị nri n'ụbọchị ahụ. O kwukwara na Kanu sị na ndị DSS enyebeghị ya ọgwụ ya kemgbe abalị itoolu n'ihi na ha kwuru na ha enwgehi ego izụta ihe ndị a. Oge ha jụrụ ndị DSS, ha kwuru na ha enweghị ego iji na-enye Kanu nri. N'ihi nke a, nwanne Nnamdi Kanu bụ Emmanuel kwuru na ha ga-ewegara ndị DSS akwụkwọ 'cheque' otu nde naịra ka ha si na ya na-eleta Nnamdi Kanu, na-enye ya nri nakwa ọgwụ. Emma Kanu gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ eziokwu na ndị DSS sị na ha enweghị ego iji nye Nnamdi Kanu nri maọbụ ọgwụ. ""Mana taa, (bụ Tọzde, Disemba 16) SAN ga-ede akwụkwọ cheque maka otu nde naịra nke anyị ga-enye ndị DSS iji na-enye ya nri, ebe ọ bụ na gọọmentị etiti enweghị ike ileta ya anya nke ọma,"" ụlọ ntaakụkọ Punch kwuru. Afunaya BBC Igbo na ebubo ndị a achịtaghị ajaa dịka ọ kọwaara BBC Igbo na ndị mmadụ ma ụma ekesa akụkọ ụgha banyere ngalaba ha iji tetọọ aha ha nakwa ọrụ ha. Nke a abụghị nke mbụ ọtụtụ ndị mmadụ na-eji aha Biafra anakọ ndị mmadụ ego na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Otu kpọrọ onwe ha 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) nke Nnamdi Kanu bụ onyeisi ya na-akpọ ogu ego kwa mgbe kwa mgbe n'oge gara aga, bụ nke ha sị na ha ji agba mbọ maka nnwereonwe Biafra. Dịka gọọmentị Naịjirịa jidere Nnamdi Kanu n'ọnwa June 2021, ndị isi Ipob na ndị ọzọ na-akwado ndọrọndọrọ Biafra ka na-agakwa n'ihu na-anakọ ndị mmadụ ego. Otu n'ime ha bụ Simon Ekpa, onye bi na mba Finland ma were akara soshal midia ya na-akpọ oku nnwereonwe Biafra. N'ụbọchị 12 nke ọnwa Nọvemba afọ a, Ekpa hazikwara agbamọnya ego ọzọ nke o kwuru na ọ bụ iji kwadoo otu 'Eastern Security Network (ESN), maka iji na-echekwa mpaghara Biafra. Chetakwa na Ipob - nakwa ESN - bụcha otu gọọmentị Naịjirịa machiri amachi ma kpọọ ha ndị na-eyi ndụ egwu. N'ụbọchị 13 nke ọnwa Disemba 2022, ọkaiwu ọzọ na-anọchite Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor gbara Simon Ekpa akwụkwọ n'ụlọikpe n'ebubo ịmetọ aha Ipob na aha Mazi Kanu. Bịafra n'oge mbụ bụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ndị dọpụrụ onwe ha n'afọ 1967 ma kwuo na ha chọrọ ịbụ mba nke aka ha. Nke a mere ka Naịjirịa buso mpaghara ahụ agha nke a lụrụ ihe ruru ọnwa iri atọ, ma tufuo ndụ mmadụ ruru nde abụọ dịka ngụkọ si gosi. Dịka Naịjirịa meriri agha ahụ, mpaghara a bụ Biafra lọghachiri azụ n'ime Naịjirịa. Mana ọtụtụ ndị bi na mpaghara ahụ na-ebo ebubo na gọọmentị Naịjirịa na-emekpa ha ahụ, ma na-akpachapụ ha akpachapụ n'usoro ọchịchị. Nke a mere ka ụfọdụ ndị ntorobịa na-ekwu na ha chọkwara isi na Naịjirịa pụọ ọzọ ma nwere onwe ha. Ka ọ dị ugbua, enwere ọtụtụ otu na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra. Ha gụnyere: 'Indigenous People of Biafra (IPOB); Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra (Massob); Biafra Independence Movement (BIM); Biafra Zionist Movement (BZM), wdg." https://www.bbc.com/igbo/articles/cp9kgn3wrpmo +health Coronavirus update: Gọọmentị Naijiria eji coronavirus ebupu ego? Gọọmentị Naijiria eji coronavirus ebupu ego? Gbazie anya ka ị hụ na-ejighị akụkọ ụgha duhie gị. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Chimezie Ucheagbo https://www.bbc.com/igbo/52683265 +entertainment Patoranking: Ọ bụ mmasị m ịchụta ụmụnwaanyị n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị mere m ji bido ịgụ egwu Na mkparịtaụka Patoranking na BBC nwere n'afọ 2018 kọwara etu o si too na etu o si bido ịgụ egwu. Ọ kọwara na ihe niile ọ mụtarala n'ụwa bụ n'ogbe Legọs ka o si mụta ya. N'okwu ya, ọ sị na o bu ụzọ bido ịgba egwu garala n'ogbe mana mgbe ọ gara ụlọakwụkwọ, ọ chọpụtara na naanị etu mmadụ ga-esi achụta nwaanyị n'ụlọakwụkwọ bụ ma ọ bụrụ na onye mara etu e si agụ egwu. Ọ sị na ọ bụrụ na ị naghị agụ egwu mgbe ahụ, mara na i soghi n'egwu. Ọ bụ etu a ka o si bido ịgụ egwu. Patoranking tinyekwara ọnụ na ndọrọndọrọ na-adị n'etiti ndị nsonso otiegwu dị icheiche. N'uche ya, ọ sị na ụdị ndọrọndọrọ a socha n'ime ọrụ iti egwu. Ihe kachasị mkpa bụ ma ị na-enwekwa aṅụrị? N'otu aka ahụ, ọ gwakwara BBC n'otu ihe kachasị dị ya mkpa ime n'ụwa ya bụ ịkwalite ọnọdụ ndụ mmadụ 100,000 ma ọ pekatampe. N'uche ya, obi ga-eju ya anụrị ịhụ na ọ mere ka ndị mmadụ nwee ihe ha ga na-eri iji dị ndụ. Onye bụ Patoranking Ezigbo aha Patoranking bụ Patrick Nnaemeka Okorie. Ọ bụ nwafọ Onicha n'Ebonyi steeti. Ọ gbara afọ 32. Amụrụ Nnaemeka na Legọs, ebe ahụ ka ọ nọ too. Patoranking na-ede egwu ma na-agụkwa agụ. Ọ gụọla ọtụtụ egwu wuru ewu n'ụwa niile ma nwetekwa ntụrụugo pụrụiche n'ịgụ egwu. Ntụrụugo dịka Headies, MTV Africa Music Awards, AFRIMA na ndị ọzọ. Gere ihe o kwuru n'uju n'onyonyo a dị n'akụkọ a. https://www.bbc.com/igbo/articles/cv2pv8rz77ro +health Covid-19 n'otu nkeji: Artemisia ọ na-agwọ coronavirus? Onyeisiala mba Madagascar bụ Andry Rajoelina gwara ndị obodo ha ka ha na-aṅụ mmiri ọgwụ e ji Artemisia na ahịhịa ndị ọzọ wee mee iji gwọọ ọrịa coronavirus. Mana otu 'World Health Organisation' nakwa ngalaba ahụike mba ahụ ekwuola na onweghi nnyocha gosiri na ya bụ mmiri ọgwụ na-arụ ọrụ. Nnyocha dị icheiche ka na-aga n'ihu n'akụkụ ụwa niile iji chọpụta ma a ga-ahụ ọgwụ nke ga-arụ ọrụ. Ka ọ dị ugbua, onwebeghi ọgwụ nke e wepụtarala. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chukwunaeme Obiejesi https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-52405093 +business Christmas Message: Ị na-arụ ọrụ ndị a? Chefuo maka 'ezumike' "Ị nọ n'ụlọ gị ugbua enweta ezumike? Mara na enwere ndị ọrụ ha ekweghị ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. Na ndị mmadụ na-ala ụlọ ekeresimesi maọbụ na ha nọ n'ụlọ maka ezumike a kpọrọ ""public holiday"" abụghị maka ọtụtụ n'ime ndị na-arụ ọrụ ndị a. Ya mere, ka ị na-ekpori ndụ gị na-enwe aṅụrị, cheta na enwere ndị nọ ebe ha nọ na-eme ka ụbọchị na-aga were were na ndụ ndị mmadụ. Otiegwu a ma ama bụ Olamide chetakwara ha. Ebe o si ""ka njọ"" bụ na ọrụ ha enweghị nkwụsị, ọ bụ ọrụ a na-arụ ụbọchị asaa n'ime otu izu. Ị nwere ike ịlelị ha anya, mana ị ma ụdịrị uru ha bara ọkachasị n'oge ezumike a? BBC chọrọ ịkọwapụta ụfọdụ n'ime ha: 1) Ndị ọkwọụgbọala/ọgbatumtum: Kedụ ụzọ ọzọ ị ga-esi gazuo ebe niile na-agụ gị ịga maọbụrụ na ị nweghị ụgbọala? Ọ bụ ndị ọkwọụgbọala maọbụ ọgbatumtum ga-ebuga gị ebe niile ị chọrọ ịga. Ọ bụrụzịkwanụ na ha chịba ụkwụ n'ụlọ sị na ha nọkwa n'ezumike dịka ị si nọrọ, ị mara na ị ga-abụzị oji ụkwụ aga Aba. 2) Ndị ọrụ nchekwa: Ndị uweojii, ndị agha na ndị ọzọ ọrụ ha bụ ichekwa obodo kwara akpa ha lawa n'ụlọ kwuo na ha na-emechi ọrụ maka ezumike, kedụ onye ga-elekọta obodo? Ndị ọrụ nchekwa anaghị emechi makana oge niile, anya kwesịrị iru ha ala n'ihe na-aga ebe niile, ka ọgbaghara ghara ịdapụta. Ọrụ ha gụnyekwara ịhụ na ị labara n'udo, ma hụ na anya gị abụọ mechiri ọfụma ka ị na-arahụ ụra. 3) Ndị ntaakụkọ: Ọ bụrụ na ndị ntaakụkọ ghara ịrụ ọrụ, kedụ etu ị ga-esi mara ma a sị ""ngwanụ gbafuonu""? Ọrụ ndị ntaakụkọ dị ezigbo mkpa makana etu ahụ ka ị ga-esi mara ihe na-eme n'akụkụ gị nakwa na mbaụwa. Ebe o si kara ndị na-arụ ya mma bụ na e nwere ike irụbiri ya arụbiri, nke bụ na ị rụtụ obere, onye ọzọ arụtụkwa obere, mana akụkọ ga-agarịrị n'ihu. Ma ndị na-arụ na redio, ihe onyonyo, ndị na-ede ede, ndị na-agụ agụ, onye ọbụla na-apụta n'ọgbọ n'agbanyeghị ụbọchị ọ bụ. 4) Ndị na-arụ n'ụlọọgwụ: E kwesịrị ichetara gị uru ndị dọkịta na nọọsụ bara na ndụ mmadụ? Ọrụ ha anaghị ama mgbe bụ ụtụtụ, abalị, maọbụ ụbọchị ezumike, n'ihi na ha ga-anọ ya ma mmadụ anọ n'ogige ha maọbụ anọghị, makana anaghị amacha mgbe ihe ga-ebute mmadụ. 5) Ndị na-arụ n'ọdọụgbọelu: A ga-asị ndị mmadụ emela njem ụgbọelu n'ihi na ""ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ezumike""? Ị mee elu mee ala, ndị mmadụ ga-emerịrị njem, mana kedụ onye ọ bụ ọrụ ya ịhụ na ị mere njem ụbọchị kwesịrị ịbụ nke ezumike? Ọ bụ ndị na-arụ ọrụ n'ọdọụgbọelu; dịka ndị ọkwọụgbọelu, ndị na-elekọta ndị mmadụ n'ime ya nke Bekee kpọrọ ""air host/hostess"", ndị injinia ọrụ ha bụ ilekọta ụgbọelu tupu o felie nakwa ndị ọzọ ọrụ ha bụ ịhụ na njem gị n'ụgbọelu ga-aga ọfụma. 6) Ndị na-ere nri: Eeh! N'ezie ọ na-akara ọtụtụ ndị mma isi nri ha ga-eri n'ụlọ ha, mana kedụ maka ndị na-enweghị ohere ahụ? Kedụkwanụ maka ndị na-apụ ọrirị ebe a na-ere nri dịka ụlọ oriri na nkwari na nke Bekee kpọrọ ""fast food joint""? ""Nri bụ ndụ"", ndị na-ere nri ma nke a, ya mere ha ji azọ ndị mmadụ ndụ site n'ire nri ma n'ụbọchị ezumike o, ma n'ụbọchị nkịtị. 7) Ndị ọrụ gbatagbata: Ndị ọrụ ha bụ imenyụ ọkụ ọgbụgba, ndị ọrụ ha bụ ịzọpụta ndị mmadụ n'ihe mberede nakwa ndị ọzọ na-arụ ụdịrị ọrụ ndị a, anaghị achịba ụkwụ n'ụlọ. Ha na-aga ọrụ makana ụdịrị ọdachi a nwere ike ịdapụta. 8) Ndị nchekwa ụlọmkpọrọ: Ha laa ezumike, onye ga-echekwa ndị nọ n'ụlọmkpọrọ? Ọrụ ha bụ ịhụ na ndị a tụrụ nga agbafughi ga kpaa mkpamkpa, ya mere ha ga-anọ ya site n'ụtụtụ ruo n'abalị, ịhụ na ihe ndapụta adapụtaghị. Ka mmadụ ghara ikwu ""aka m adịghị n'ihe mere"". Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-46667279 +entertainment Lizzy Anjorin vs Toyin Abraham: 'Agaghị m etinye ọnụ n'okwu mmadụ abụọ a' "Esemokwu dị n'etiti Toyin Abraham na Lizzy Anjorin bụ chi na-efo ọ na-abawanye. Nke mere ọhụrụ bụ akụkọ na-ewu na otu nwada Igbo ebola ya bụ nsogbu n'isi nwaada Igbo ọzọ na-eme ihe nkiri aha ya bụ Nkechi Sunday Blessing. Mana mgbe BBC Igbo kpọrọ Nkechi Blessing, ọ gwara anyị hoo haa na onweghị ihe gbasara ya n'esemokwu ahụ. O kwuru na ọ bụ eziokwu na ya na Toyin Abraham bụ ezigbo ọyị mana Toyin dọrọ onye ọbụla nọ n'akụkụ ya aka na nti ka ha hara itinye ọnụ n'okwu dịrị ya na Lizzy Anjorin. Blessing kwuru na ọ bụ makana ọ gbara nkịtị kamgbe esemokwu a bidoro kpatara ndị mmadụ ji na-ebo ya na o butere ya bụ okwu. Etu esemokwu Lizzy Anjorin na Toyin Abraham si malite Ndị tinyegoro ọnụ n'okwu a Otu dịka ""Theatre Arts and Motion Pictures Association of Nigeria""(TAMPAN) gosiri iwe ha gbasara esemokwu mmadụ abụọ a na-ese. Ndị na-eme ihe nkiri na Yoruba a ma ama dịka Yinka Quadri , Bolaji Amusan nakwa di Toyin bụ Kola Ajeyemi arịọla ha ka ha tinye mma ha n'ọbọ. Esemokwu dị n'etiti ndị ihe nkiri abụghị ihe ọhụrụ , ọ na-emekarị n'etiti ụmụnwaanyị na-eme ihe nkiri." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49796448 +religion Apostolic Nuncio: Lee Achịbishọp Fortunatus Nwachukwu na Thaddeus Okolo, ụkọchukwu Igbo abụọ bụ 'Papal Nuncio' A na-ezitara ndị okpukpere ụka Katọlik na Naijiria ndị ndu si Vatican a kpọrọ 'Papal Nuncio'. Ọtụtụ n'ime ha na-abụkarị ndị ọcha mana ị ma na e nwere ụmụafọ Igbo nọ na nnukwu ọkwa na mbaụwa? Papal Nuncio maọbụ 'Apostolic Nuncio' bụ onye nnọchiteanya nke Bekee kpọrọ 'Ambassador' nke Rome na mba ndị ọzọ. Ndị a na-eme papal nuncio na-abụkarị ndị bishọp kajara akaja na nkuzi Katọlik. Ụmụ Naijiria atọ ma bụrụkwa ụmụafọ Igbo, bụ ndị na-anọchịte anya ọchịchị Rome na mba ụwa; Achịbishọp Fortunatus Nwachukwu n'Antille, Achibishọp Thaddeus Okolo n'Ireland na Achịbishọp Brian Udaigwe n'Benin na Togo. Ihe ị maghị maka Achibishọp Fortunatus Nwachukwu Ihe ị maghị maka Achịbishọp Brian Udaigwe(Benin na Togo) Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50349512 +politics Anambra Governorship Election 2021: Ihe ndị mmadụ gwara Simon Ekpa dịka ọ sị na agaghị eme ntuliaka "Dịka ntuliaka a ga-eji họpụta aka ga-achị Anambara Steeti na-abịa nso, otu onye otu na-achọ nwereonwe mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Simon Ekpa apụtara kwuo na agaghị eme ntuliaka na steeti ahụ. Okwu Maazị Ekpa a dabanyere na nke onyeisi Ipob bụ Nnamdi Kanu na-ekwu tupu gọọmentị Naịjirịa anwụchie ya ma kpụlata ya Naịjirịa. N'ụbọchị 22 nke ọnwa Mee 2021, dịka ọ na-agbasara ndị otu ya ozi, Kanu sị na ya na ndị otu ya agaghị ekwe ka emee ntuliaka n'Anambra maọbụ ịchụnta vootu. Ọ sịkwa ka ha mebie ihe niile e ji akwado ntuliaka dị na steeti ahụ. Ọ bụ na Twitter ka Maazị Ekpa dere ebumnuche ya banyere ntuliaka Anambara a ma si ka ndị mmadụ gwa ya uche ha banyere atụmatụ ahụ. Ụfọdụ n'ime ndị sara ya okwu nabatara atụmatụ ahụ ebe ndi ọzọ sị na ha ekweghị na ya. Ekpa si na ihe mere ya ji asị na ntuliaka nwereike agaghị emezi na ""ala Biafra"" bụ ""makana ọ bụ otu ụzọ e ji agwa ndị ndọrọndọrọ na-eme nrụrụaka na egwu agwụla"". Ọ sịkwa na emeghị ntuliaka ga-eme ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị taa ahụhụ maka ha agaghị enwezi ike - ọ sị na nke a ga-ebute mkparịtaụka banyere Biafra. Mana, otu onye aha ya bụ ""SirPope"" sara Maazị Ekpa were sị na ihe a ọ na-ekwu nwereike mee ka ndị mmadụ gbanye Ipob azụ. Ọtụtụ ndị ọzọ tinyekwara ọnụ ha na-ekwu uche ha banyere atụmatụ ahụ. N'oge a na-akwado ntuliaka nke e ji ahọpụta aka ga-achị Anambara n'afọ 2017, Kanu sịkwa ka a ghara ịtụ vootu mana ndị mmadụ mechara tụọ vootu. BBC Igbo jụkwara ihe oche maka atụmatụ na ebumnuche ya agaghị akwụsị ndi mmadụ ịtụ vootu mana ọ gbadosịrị ụkwụ ya n'ala were kwuo na ọ ka bụkwa uche ya. N'oge ahụ, ọ ka na-ekwu ka a ghara ịtụ vootu nke 2019, mana abalị abụọ ya na BBC Igbo mechara mkparịtaụka, ọ gara n'ihu sị ka ndị otu ya soro mee ntuliaka ahụ. Mana, dịka ọtụtụ n'ime ha edenyeghi aha iji tozuo iso me ntuliaka, ha atụghị vootu." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58187994 +entertainment Igbos in Egypt: 'Ị gaa Cairo, nri Igbo agaghị akọ gị' Ị gatụla Ijipt mbụ? Ọ bụrụ na ị na-akwado ịga, nri ndị Igbo agaghị abụ nsogbu gị makana o juru eju bara abara. Lee ihe nkiri a ka ị hụ ka nwada Favour na-ere ya bụ ihe nri nakwa etu o si eme ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48918950 +health Coronavirus: A ga-agbachi ọdọụgbọelu Legọs na Abuja maka coronavirus Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-agbachi ọdọụgbọelu dị na Legọs na Abuja malite na Mọnde abali iri na atọ nke ọnwa Maachị maka otu ọrịa a kpọ n'ọnụ bụ coronvirus. Onyeisi ụlọọrụ Nigerian Civil Aviation Authority bụ Musa Nuhu sị nke a bụ ịgbakwụnyere n'ọdọụgbọelu nke Enugwu, Pọtakọt na Kano e mechirila na mbụ. Ọ sị mmechi a ga-adị ruo ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Eprelụ. Kama na mfepu na mfebata ụgbọelu ndị dị ezigbote mkpa ga na-aga n'ihu n'oge mmechi a. Nke a na-abịa dịka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus na Naịjirịa ugbua eruola iri abụọ na abụọ Nke na-akpọtụ ugbua bụ na enwere ihe mberede okporoụzọ n'elụ akwa mmịrị nịaja ebe otu obere ụgbọla makpunyere n'okpuru gwongworo. Ndị uweojii na ndị Federal Road Safety nọ ebe ahụ ugbua ịmata ihe mere ya. Ọnweghị onye nwụrụ n'ime mmadụ isii ya bụ ihe metutara, mana mmadụ anọ n'ime ha meruru ahụdịka ndị ọrụ Road Safety si kwụọ. Mmadụ anọ ndị ahụ nọ na FMC Asaba anata ọkwụkwọ ka ọ dị ugbua. Road Safety sị na ọ bụ oke ịgbaọsọ n'aka onye obere ụgbụọla Toyota Celica bụ ihe mere o ji sọkanye isi n'okpuru gwongworo Mark ahụ. Ka o dị ugbua, ebupula ụgbọala abụọ ahụ n'ụzọ nke mere ụzọ ji aga were were. Onyeisi Federal Road safety n'Anambra steeti bụ Andrew Kumapayi na-arịọ ndị mmadụ ka ha benete aka n'oke ọsọ ma ghara ịgbafe oke asịrị ka aghara ịgba ọkachasị n'ebe dị kpachị kpachị. Mmadụ iri ọhụrụ ọzọ ebutela coronavirus na Naịjirịa Mịnịsta ahụike na Naịjirịa bụ Osagie Ehinare ekwupụtala na mmadụ iri ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa. Nke a mere ya mmadụ iri abụọ na abụọ buterela ya na Naịjirịa ugbua. Ọ sị na mmadụ 16 si na Legọs, 3 si na Abuja, 2 si n'Ogun steeti ebe 1 si n'Ekiti steeti. Ehinare gara n'ihu kwuo na mmadụ abụọ enwerela onwe ha ebe a na-elekọta ndị ọzọ anya n'ụlọọgwụ di iche iche ugbua. Ụnụ anụrụ Ụlọakụ gọomentị etiti akụdaala ọnụego ana ere dọla. Ugbua, ya bụ ụlọakụ na-eresizia ụlọakụ ndị ọzọ narị naịra atọ na iri isii (N360) nke ji pasent iri na ise (15%) karịa ihe ana erebu ya na. Nke a ga-eme ka ndị ụlọakụ obere na ndi ahịa Bureau de change rewezie dọla otu ọnụego. N'Afrịka, otuiegwu ama ama bụ Aurlus Mabélé anwụọla n'ụlọọgwụ dị na Paris, France. Kepu kepu na-ana anụ n'aka ndị na-eso ya na soshal media na-ekwu na ọ bụ Coronavirus gburu ya, mana BBC achọpụtabeghị nke ahụ ka ọ bụ eziokwu. Ọzọ dịka ibe ya bụrụkwa na otuegwu ọzọ ama ama bụ Kenny Roger nwụọla ka ọ gbara afọ iri asatọ na otu. Onye ezi na ụlọ ya sị na ya bụ nwaamadị kụwara egwu kemgbe 1976 rahụru nwụọ ka ọ nakpuru. Enenewe ejeghị ọlụ na Naịjirịa bụ Ikpe-Etim na oti egwu Waje etinyele onwe ha n'ọnọdụ nkwụcha. Nse ikpe mere nke a kemgbe o si UK lọta , mana Waje mere nke ya makana ọ nụrụ na-ekwuru ka ndị niile gara AMVCA tinye onwe ha n'ọnọdụ ahụ. Ha gbara ama n'akara Instagram ya bụ ebe ọnọ kwụọ na ya mere nke a dịka ntuzịaka gọomenti sị kwuo maka ịgbochị ọrịa Covid-19. N'Afrịka,. ndị na-eme ngagharị iwe na mba Ọljirịa ejirile aka ha kagbuo ngagharị iwe nke izu a maka ọrịa Covid-19 Mmadụ iri n'ime iri itoolu ndị bu ọrịa a anwụọla na mba ahụ kemgbe ya bụ ọrịa malitere. Oruola mgbe aga etinye ọnụ n'okwu ibugharị ụbọchị mmalite egwuregwu Tokyo 2020. Mbanụ, ọ bụ Nic Coward, onyeisioche egwuregwu dị iche iche n'UK na-akwado ya bụ emume sị na ọbaghị uru isiọnwụ na-aga eme ya bụ asọmpi ebe akagbuchagoro egwuregwu eji akwado ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-51957556 +sports Chelsea vs Man United: E reela Chelsea ka ọkpa 9th Mile rie 'change' Na Chelsea nyere goolu abụọ a gụfuru agufu azọnwughi ha n'aka ndị Manchester United riri ha ka ọkpa dị ọkụ n'ụlọ ha. Goolu abụọ Anthony Martial nyere na nkeji 45 na nke Harry Maguire nyere na nkeji 66 zuru ịgba ha n'akpa ma nye Man Utd mmeri ha chọ bịa Stamford Bridge. Bido n'isi egwuregwu a ka ndị Man Utd zọwara Chelsea Ojukwu, ọkachasị mgbe e wepụrụ N'golo Kante mere ka ọ na-achaturu ha ọkụ na nkeji iri e ji bido bọọlụ. E ji mkpebi ihe onyonyo VAR gụfuo goolu abụọ ndị Chelsea gbakanyere, nke mere ka obi daa ndị na-akawado ha ka ebe a wụrụ mmadụ mmiri ọkụ. E bu ụzọ gụfuo goolu Kourt Zouma dịka VAR gosiri na aka Caesar Azpilicueta kwara Brandon Willliams enyeghị ya ohere ịgbafu bọolụ dịka onye egwu azụ. Ebe a gụfuru nke Olivier Giroud na nkeji 76 dịka VAR gosiri na ụkwụ ya gafere ebe ọ na-ekwesịghị. Ndị mmadụ na-eti mkpu na e kwesịrị ịchụpụ Maguire dịka ọ zọrọ Michy Batshuayi ụkwụ n'amụ, mana VAR nyochara ya sị na e nweghi ihe ọjọo mere. Odion Ighalo bụ onye ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ dịka Chelsea nabatara Manchester United na Stamford Bridge. Ndị Naịjirịa kere ajị n'ume na-eche ịma ma nwanna ha ọ ga-aza aha nna ya. Mgbe e wepụrụ Martial webata ya na nkeji 90, ọ nwara ike ya ịgbakanye goolu, mana isi ya apụtaghị. Ka ọ dị ugbua, Chelsea ka ji pọịntị 41 nọrọ n'ọkwa anọ na tebulu Premier League ebe Man Utd ji pọịntị 38 si n'ọkwa itoolu rigoro asaa. N'egwuregwu ikpeazụ ha gbara tupu nke a, Chelsea na Leicester City ji goolu abụọ abụọ dọọ ka ọkwụrụ, ebe Man Utd na onwe ha gba aka goolu mgbe ha gbara ọnyụpa ka ha na Wolves zutere. Gịnị gbasara Ighalo? Ighalo bụ onye Naịjiria mbụ ga-agbara Manchester United kemgbe ha kpọrọla ya na mbinye ebe ọ ga-anọ ọnwa isii, so na ndị a kpọpụtara nwereike iso agbaso Chelsea bọọlụ. Dịka Ole Gunna Solskjaer bụ onye nchịkọta Man Utd na-atụ anya na Ighalo na Bruno Fernandes ha zụrụ ọhụrụ ga-etikọta isi ọnụ gwọọ Chelsea ara. N'ụbọchị nke 16 nke ọnwa Febrụwarị a, chi fotere ụbọchị asọmpi Man Utd na Chelsea, ka Ole kwuru na Ighalo nwereike ịnọrọzị n'otu ya ma ọ bụrụ na ihe jikọrọ ya na Shanghai Shenhua bie n'afọ a. Mana kedụ ihe ị che? Odion ọ ga-agbatanwu ihe Man Utd ga-eji kwụzịa ụgwọ isi ya? https://www.bbc.com/igbo/afirika-51536116 +health "Coronavirus Response: ""Ihe mere coronavirus ejighị kpa ike n' Afrika ka mba ofesi "" - Esther Osemwegie" Ọrịa coronaviru ataala isi ọtụtụ ndị dọkịnta, ndị nọọsụ na ndịọrụ ahụike ndị ọzọ. Mana akụkọ a ga-adị ka aja mbele ma ọ bụrụ na i jibeghi anya gị hụ onye o metụrụ. Esther Osemwegie, onye na-arụ ọrụ dịka nọọsụ n'obodo oyibo kọro, BBC Igbo ihe o jirila anya ya hụ. O kwuru na ịgwọ ndị coronavirus dị ka onye agha nọ n'ọgbọ ọgụm o nwere ike ịnwụ n'oge ọbụla. Ihe niile a ọ gabigara mere o ji dee akwụkwọ nke o kwuru na ọ chọrọ iji kụzie ọtụtụ ihe ma dọkwaa ndị mmadụ aka na ntị. Ndị mere akụkọ a Uche Akolisa https://www.bbc.com/igbo/afirika-55455496 +business Barber Shop: Ụlọọrụ ebe a na-eyi 'Suit' akpụ isi Kootu bụ uwe eji mara ndị na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ dịka ụlọ akụ, kama ndị ntoroọbịa a ji ya arụ ọrụ aka. Azubuike Jonathan na Thankgod Nweze bụ ndị na-arụ n'ebe a na-eyi kootu akpụ isi ekwuola ihe mere ha jiri bido ya. Lee etu ha sị arụ na ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ha. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58311227 +health Coronavirus Tips: Etu ị ga-esi mara ma ị nwere coronavirus Ọ bụrụ na ị hụ ihe ndị a n'ahụ gị, mara na ị ga-akpọtụrụ ndị ahụike ka ha gwa gị ihe ị ga eme. Chetakwa na ọbụghị mmadụ niile nwere coronavirus n'ahụ ha ga-enwe ihe ngosi nke bekee kpọrọ 'symptoms'. Ya bụ cheta ka ị na-akpachapụrụ onwe gị anya site n'ịkwọcha aka gị oge niile nakwa izere mmekọ ahụ gị na ndị mmadụ. https://www.bbc.com/igbo/52582416 +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Mba Afrịka abụọ apụọla n'asọmpị iko mbaụwa Akụkọ ndị dị mkpa Ndị uweojii achọtala ogbunigwe n'isi ụlọọrụ otu PDP na abakaliki nke butere nzụkọ gbata gbata n'etiti gọvanọ Umahi na ndị isi ọrụ nchekwa Umahi kwukwara na ọ ziela ndị nchekwa ha mee nyocha zuruoke gwa ndị isi ha ebe ọ ga ezigara onyeisiala okwu maka ihe a mere. Mahadum Obafemi Awolowo achụọla onye nkuzi chọrọ ị dina nwata akwụkwọ ya tupu ọ gafee ule ya. Nke a bịara mgbe nyocha Mahadum ahụ mere gosiri na nwata akwụkwọ ahụ gafere ule ya. Ha kwuru na ha na-eme ihe ịhụ na akwụsịrị ndị nkuzi ị dịna ụmụakwụkwọ kpam kapm. Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump ebinyela aka n'iwu pụrụiche kwuru na agaghị ekewa ezinaụlọ ndị mbịara mbịara na-achọ ị bata Amerịka O kwuru na ihe kachasị mkpa bụ nnọkọ ezịnaụlọ na nchekwa oke Amerịka na mba ndị ọzọ N'egwuregwu, Spen ji otu ọkpụ merie Iran ụnyaahụ ebe e wepuru goolu Iran nyere na agba nke abụọ. Ajentina na-akwado ị zute Kroeshia taa ebe Fransi na Peru ga-asọmpị ebe elekere anọ nke ehihie. Ihe ndi ọzọ ị kwesiri ị ma Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuputala na anya edoghi ya n'akwụkwọ bọọjetị 2018 nke o binyere aka na ya ụnyahụ. O kwuru na o nwere ụfọdụ ego ndị ụlọomeiwu ukwu gbanwere tupu ha nye ya ya bụ bọọjetị. Ọ kọwara ya n'ozi ọ gbasara site n'akara soshal midia twita ya Gee nkeji nke ụtụtụ ebe a Lee ihe Yul Edochie kwuru gbasara ndị ntorobia na-akwado ị zọ ọchịchị https://www.bbc.com/igbo/afirika-44559529 +politics Ihe ise m ga-eme ma m zọta ọkwa onyeisiala Naịjiria - Atiku Abubakar "Atiku Abubakar bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjiria n'okpuru pati Peoples Democratic Party (PDP), ekwuola ihe ọ chọrọ imere Naịjiria ma ọ zọta ya bụ oche. Na mkparịtaụka ya na BBC Hausa nwere nso nso a, Atiku kwuru na ọ ga-agbado anya n'ime ihe ise gbara ọkpụrụkpụ ma ọ bụrụ na ọ banye n'oche onyeisiala. 1) Iwelata ndịnotu n'etiti ndị Naịjiria Atiku kwuru na nkewa na akpamoke dị n'etiti agbụrụ ndị dị na Naịjiria, na ọ bụghị naanị n'ihi ntuliaka na-abịa. Ọ gara n'ihu kwuo na ihe gbasara ọchịchị bụ otu n'ime ihe kachasị ebute nsogbu na mpaghara Ndịda, Ugwu, Ọdịda na Ọwụwa Anyanwụ Naịjiria, ya mere o ji sị na ọ ga-agba mbọ ịhụ na o weghachitara ndịnotu na Naịjiria. 2) Iwelata udo Otu ihe kacha echere Naịjiria aka mgba n'ime afọ ole na ole a bụ nchekwa. Ịma atụ, ewezuga ndị oyindụegwu Boko Haram na ISWAP, e nwere ndị ntọ mmadụ na-atọ mmadụ maka ịnapụta ha ego isi mgbapụta. E nwekwara nsogbu n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo, ndị na-achọ nnwereonwe na nkewa dị n'etiti ndị ndịda na ndị ugwu na Naịjiria. 3) Mwulite ọnọdụ akụnaụba Naịjiria O kwuru na akụnaụba obodo Naịjiria na-akpụ afọ n'ala kemgbe, dịka ndị ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba obodo si kwuo. Nke a sitere n'ọdịda mmanụ agbịdị n'ahịa mbaụwa nakwa mpụta ọrịa-ozuru-ụwa-ọnụ Covid-19 kemgbe afọ 2020. O kwuru na etu ihe niile si arị elu na-etinye ndị Naịjiria n'ọnọdụ ọjọọ. 4) Mgbanwe ọnọdụ agụmakwụkwọ Ọtụtụ na-ahụta ya na ọnọdụ agụmakwụkwọ na Naịjiria - site na praịmarị ruo mahadum - na-akpụ afọ n'ala, site n'ihe gụnyere enweghi ngwaọrụ, enweghi ezigbo ndị nkuzi tozuru etozu, mmebi ụfọdụ ụlọakwụkwọ nakwa ọchụchụ ndị nkuzi na-anaghị eme ọfụma. Nke a ejula ndị Naịjiria anya. A bịa na ogogo mahadum, oke abụbụọrụ ndị nkuzi na-agba n'ihi ụgwọ ọnwa e ji ha, emeela ka ọtụtụ ndị kwesịrịla ịgụcha mahadum ka tọ n'ụlọakwụkwọ ebe ndị ọhụrụ kwesịrị ịbata mahadum ahụghị ụzọ bata. 5) Mmegharị iwu obodo Naịjiria Ndị omeiwu Naịjiria ebinyela aka n'okwu dị iche iche e kwesịrị ime iji megharịa iwu Naịjiria. Site na ntuliaka imeụlọ PDP mere, e nwere nkewa n'etiti ndị otu ha, mana Atiku kwuru na ha ehiwela kọmitii ga-eleba anya n'ihe kpaliere okwu ma hụ na udo na ịdịnotu lọghachịtara n'etiti ndị pati ahụ. ""Enweghi etu nnukwu pati dị ka PDP ga-esi mee ntuliaka na-enweghi nsogbu ọbụla. Anyị ka na-akpa, n'aha Chineke anyị ga-emezi,"" ka Atiku kwuru. Pati niile nọ na Naịjiria emechaala ntuliaka imeụlọ ha, ma kwuo na ha dị njikere maka ntuliaka afọ 2023 na-abịa. Ndị ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ekwuola na ọgụ a ga-esi ike n'etiti ndị All Progressives Congress (APC) na ndị PDP." https://www.bbc.com/igbo/articles/cy7qv5p9wxwo +health Dexamethasone: Gịnị bụ ọgwụ a a sị nwereike ịgwọ coronavirus? "Ndị sayensị chọpụtara na ọgwụ dexamethasone nwere ike inye aka n'ịgwọ ndị bu ọrịa coronavirus. Ndị ọkachamara na mba Briten kwuru na ọgwụ a so n'otu n'ime ọgwụ ndị a na-enyocha, e nwere olileanya na ọ ga-agwọnwu ọrịa a. Mana ọtụtụ mmadụ na-ajụ kedụ ọgwụ bụ dexamethasone na ihe mere e ji sị na o nwereike inye aka n'ịgwọ coronavirus? Otu onye ọkachamara n'ihe banyere ọgwụ ma bụrụkwa otu n'ime ndị ọkachamara n'okwu ọgwụ na West Afrịka bụ Blessing Nwagbara, kọwara ihe ọgwụ a bụ. Gịnị bụ Dexamethasone? Nwagbara sị na dexamethasone bụ otu n'ime ọgwụ ndị ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) kpọrọ ọgwụ dị mkpa kamgbe afọ 1977. Ọ bụ ọgwụ kwesịrị ịnọ n'ụlọọgwụ maọbụ ebe niile a na-ere ọgwụ n'ụwa. O so n'ọgwụ ndị a na-akpọ 'ọzọ Igbo ndụ'. O so n'ọgwụ ndị a kpọrọ 'Corticosteriods' bụ ọgwụ ndị e ji agwọ ọrịa ahụ ọzịza dị iche iche. Ọ bụghị ọgwụ a rụpụtara ọhụrụ, ọ bụ ọgwụ dị kamgbe ọtụtụ afọ. Kedụ ọrịa e ji Dexamethasone agwọ? Ihe e ji Dexamethasone agwọ kpọmkwem bụ ọrịa ahụ ọzịza a kpọrọ 'Edema' na bekee, ọkachasị nke metụtara n'akpịrị nakwa akụkụ ndị e ji eku ume (Brochus). Nke pụtara na e ji ya agwọ ndị nwere ọrịa iku ume Asthma. E ji dexamethasone agwọ ọzịza ahụ nke metụtara ọkpụkụ azụ nakwa nke ụbụrụ. E nwerekwara ike iji ya agwọ ọzịza metụtara anya. Ụdịrị Dexamethasone ole ka e nwere? Nwagbara sị na e nwere dexamethasone dị iche iche nke gụnyere; Nke mkpụrụọgwụ (Tablets), nke a na-agba agba (Injections) nakwa nke a na-atanye n'anya (Eye drop). Ọ sị na ọgwụ a abụghị nke a na-aṅụ otu ugboro ma kwụsị ya, na tupu ị ṅụọ ya maọbụ kwụsị ya na ị ga-anata ntuziaka onye ọrụ ahụike. Gịnị mere e ji sị na o nwereike ịgwọ coronavirus? Nwagbara sị na ihe mere e ji sị na ọgwụ a nwereike inye aka n'ịgwọ coronavirus bụ maka etu o si arụ ọrụ. Dexamethasone na-akwụsị ọzịza n'akpịrị nke na-egbochi onye na-arịa asthma maọbụ ọrịa iku ume ndị ọzọ ka ọ ghara iku ume. N'otu aka ahụ ka a sị na o nwekwara ike inye aka gwọọ coronavirus bụ ọrịa iku ume, ọkachasị n'ahụ ndị o ji aka ọjọọ ji igwe (Ventilator) eku ume. ""Ọ bụrụ na dexamethasone nwere ịke ịkpọpe okpoko ikuku onye na-arịa Asthma, n'otu aka ahụ, o nwekwara ike ịkpọpe nke onye na-arịa coronavirus"". Ọghọm dị n'ịṅụ ọgwụ Dexamethasone Nwagbara kwuru; ""N'agbanyeghi na ọgwụ a juru ebe niile, ọ bụghị ya ga-eme ka mmadụ ṅụọ ya na-enweghi ntuziaka, maka ibute ọghọm"". Ọ sị na ụfọdụ ọghọm dị n'ịṅụ ọgwụ a gụnyere; Ime ka mmiri dọkọrọ mmadụ n'ahụ (Fluid retention) nke nwereike ibute aka ọzịza, ụkwụ na ikpere ọzịza. Oke agụụ ịgụ mmadụ nke mere na ọtụtụ ndị na-achọ ibu ibu na-eji aṅụkarị ya. Ndị ọzọ gụnyere ịra ahụ n'ihi ụra, ịgbọ agbọ, afọ ọsịsa, ike ọgwụgwụ nakwa isi ọwụwa. N'ikpeazụ, Nwagbara sị na ọ ga-adịkwa mma ma ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa ga-enyocha ọgwụ Dexamethasone ma sị ka e were ya na-agwọ Coronavirus. Maka na ọ bụ ọgwụ dị ọnụ ala ma jukwa ebe niile, nke mkpụrụ akarịghị naịra 50 ebe nke ọgbụgba akarịghị 200 naịra." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53075802 +health Coronavirus: Ndụmọdụ ụmụ afọ Igbo nọ Chaịna na-enye ndị Naịjirịa maka nje a A na-ekwu na ọ bụ Chaina ka coronavirus si, ma na-ekwukwa na ọ bụ mba ahụ kachasi mara etu e si ebuso ha bụ nje agha. Ụmụafọ Igbo abụọ na-agụ mahadum na mba ahụ kowara ihe ha hụrụ ma nyekwa ndị nọ Naịjirịa ndụmọdụ etu ha ga-ejiri mgbochie mbanwanye nje a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52171532 +health Coronavirus Recovery: 'Etu m si bute ọria Covid-19 ma merie ya' Dịka ọtụtụ ka na-ekwu na ọrịa coronavirus adịghị na Naịjirịa, nwa afọ Igbo, Joseph Chidiebere, butere ya bụ ọrịa. Ọ maghị ebe maọbụ etu o si bute ya n'ihi na o meghi njem ọbụla. O kwukwara na o cheghị na ya zutere onye ọbụla nwere ọrịa ahụ. Mana site na mbọ ọ gbara, na sitekwa n'ike Chukwu, ọrịa ahụ ataghị isi ya. Gere akụkọ ya n'uju n'ihe nkiri dị n'elu. Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi na Chiemela Peter. Akụko ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-53171978 +politics Hope Uzodimma: Ihe ga-eme ka Ipob gbaghara gọvanọ Imo steeti - Emma Powerful "Otu Indigenous People of Biafra ekwuola na ọ bụghị ha ka gọvanọ Imo steeti na-akpọ oku ịkpa udo. Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru Ipob gwara BBC Igbo na gọvanọ Uzodimma akpọghị aha Ipob kpọm kwem mgbe ọ na-eseti aka ịnwe mkparịtaụka udo maka steeti ya. ""Ọ bụghị Ipob ka ọ na-agwa makana aha Ipob abụghị onye ọbụla, Hope Uzodimma emejọghị onye ọbụla, ọ bụ naanị Ipob ka o mejọrọ."" Mgbe BBC Igbo jụrụ ya ihe ga-eme ka Ipob gee gọvanọ Hope ntị maka mkparịtaụka udo ,Emma Powerful kwukwara sara: ""O nwere ndị na-edunye gọvanọ Uzodimma ozi ibuso ndị ntoroọbịa steeti ya agha."" O kwuru na ikpe ha na Uzodimma abụghị abụghị nke a ga-ekpezinwu kwam kwam makana ọ bụ gọvanọ mbụ kpọtara ndị agha ka ọ wakpoo otu Eastern Security Network Nnamdi Kanu hibere. Cheta na gọvanọ Hope Uzodimma setiri aka udo ụbọchị ọ na-agụpụta ozi ncheta nwereeonwe Naịjirịa na June 12, 2021. N'ozi ahụ, Uzodimma kwuru na ọ dịla njikere ịnabata mkparịtaụka udo ga-eme ka ezi nchekwa na udo zuo oke n'Imo steeti. Ọnwa atọ agara aga ahụla tigbuo na zọgbuo na steeti ahụ nke a na-ebo ndị ""unknown gunmen."" Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma ekwuola na ya ga-anabata mkparịtaụka ọbụla ga-ame ka tigbuo zọgbuo kwụsị na steeti ya. Gọvanọ Uzodimma kwuru nke a mgbe ọ na-agụpụta ozi emume ụbọchị ncheta nwereonwe Najirịa n'ụbọchị satọde bụ June 12, 2021. O kwuru na ọdịghị mma ka Imo steeti were obere akụ na ụba ha nwere na-ahazi nsogbu ogbaghara na-ebute maka nchekwa. Uzodimma kwuru na udo na-eweta ọganihu ya mere o ji di mma ka onye ọbụla tinye mma n'ọbọ ka e jiri nwayọ chọwa ihe dabara na mmiri. Cheta na kamgbe ọnwa atọ gara aga ka mkpa mkpa a ndị o ji egbe na-akpa n'Imo steeti. Mkpa mkpa a gụnyere ịgba egbe aghara aghara, ịmụnye ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ nakwa ụlọọrụ gọọmenti nakwa igbu ndị mmadụ ụfọdụ oge." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57461533 +religion Sotitobire Church: Etu akụkọ ụgha si bute igbu onye uweojii na ịgba ụlọụka ọkụ Ndị mmadụ gbara ụlọ uka Sotitobire dị n'Akure ọkụ ụnyaahu maka akụkọ ndị uweojii si bụ asị na-efere na soshal midia. Okwu a malitere n'ọnwa gara aga mgbe amaritere chọwa nwatakịrị aha ya bụ Gold Kolawole furu na ụlọụka ahụ. Nne nwatakịri a bụ Modupe Kolawole kpọ ya ga ya bụ ụlọụka mgbe atọrọ ya. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ondo steeti bụ Femi Joseph gwara BBC na ọ bụ ndị iwe na-ewe gara na ya bụ ụlọụka were gbaa ya ọkụ n'ihi na akụkọ si na-abọpụtara ozu nwantakịrị ahụ n'ụka ahụ. Nne ya bụ Kolawole gwara onye ntaakụkọ BBC na-enwere aka enwe n'ihe gbasara ofufu nwa ya. Kolawole kwukwara na ndị ụlọụka ahụ enyeghi ndị uweojii enyemaka dịka ndị chọrọ ka achọta ya bu nwa. Kama onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ kwuru na ọhụghị ozu nwa ahụ n'ụlọụka ahụ. Ndị uweojii sitere na ọnu na-ekwuchitere ha bụ Femi Joseph kwuru na ọ bu akụkọ ụgha dughere ndị mmadụ iji chee na ọ bụ eziokwu na egwụpụtara ozu ya bu nwa. Joseph kọwara na igwe mmadu iwe na-ewe gburu otu onye uweojii ma sị kwa na ọ bụ ihe onyonyo ụlọmgbasa ozi wepụtara bụ ihe mere ka akụkọ ugha a gbasaa ka ọkụ n'oge ụgụrụ. O kwukwara na igwe mmadu a jiri okwute chụọ ndị uweojii ọsọ ụkwụ eruala ma mebie ụgbọala ha. Kama o kwuru na ọ bụghi eziokwu na ndị uweojii gburu onye obụla. Onyeuweojii Joseph gwara ndị mmadụ na ha ka na enyocha ya bụ ofufu nwatakịri a bụ Gold Kolawole. Dịka ọ dị ugbua, ogbaaghara ataala isi mmadụ abụụ nke bụ otu onye uweojii na onye nkịtị. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50849059 +politics Akụkọ dị mkpa taa: PDP n'Enugwu kwu Ekweremadu n'azụ Akụkọ dị mkpa taa Osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ike Ekweremadu ewerela ikike PDP ịzọ oche Enugwu West na ntuliaka afọ 2019. Ndị so ya n'azụ bụ uche Onyekwulu, Oscar Egwuonwu na ndị ọzọ. Gọvanọ na-achị Lagos steeti bụ Akinwunmi Ambode ejirila ugwu nara mmeri emeriri ya na ntụlịaka imeụlọ APC mere na Legọsn'ụbọchị abụọ nke okotoba. O ziri ozi gwa ndị Legọs ha jisike kwado otu APC n'udo na ntuliaka na-abịa. Na mba ofesi, Na mba Congo ndị mmadụ awakpoola ndị ọrụ ahụike mgbe ha na-akwado ili ozu ndị nwụrụ site n'ọrịa Ebola. Ndị obodo ahụ mere ihe a n'ihi na ha-ekwenyeghi na ọrịa Ebola bụ ọrịa ziri ezi. N'egwuregwu, Otu egwuregwu nke Raja Casablanca agbaala Enyimba nke Abia otu goolu asataghị otu mgbe ha zutere onwe ha taa n'asọmpị Confederation of African football. Ebe otu Rangers ji ọkpụ anọ asatara abụọ merie Akwa United mgbe ha kwatara ya na Kano taa Gee Nkeji nke mgbede N'ụtụtụ, Uche Ogah ga-eburu APC Ọkọrọtọ n'Abia Dịka ntuliaka imeọnụ na-aga n'ihu na pati dị iche iche, Uche Ọga apụtala dịka onye ga-azọrọ APC ọkwa gọvanọ n'Abia Steeti n'afọ 2019. N'otu aka ahụ, Bernard Ifeanyi pụtara ịzọ ọkwa gọvanọ na pati APC n'Ebonyi steeti ekwuola na ntuliaka emere ebe ahụ juputara na mpụ na aghụghọ. Ogar nwetara vootu 86875 iji merie mmadụ isi ndị ọzọ zọsịrị ya ọchịchị. Onye kpọrọ mpụta ntuliaka a bụ onyeisi kọmiti na-ahazi ntuliaka ahụ bụ David Iyoha. Etu ndị ndọrọndọ ndị ọzọ si kwuru bụ: Ikechi Emenike (455), Chris Akomas (2123), Martins Azubuike (10889), Friday Nwosu (3529), Okey Emeuche (1270) na Paul Ikonne (999). ọ bụ sọsọ Uche Ogar na Okey Emeuche no mgbe agụrụ vootu a. Ọgụ ọzọ adawala na Jọs Ọgu na-ada na Jos, isi obodo Plateau steeti ataara isi ihe ruru mmadu iri. Ọgu a bidoro kemgbe Fraide nke izu uka gara aga ruo unyaahu. ụlọ ụka alakụba na nke kristi so na akunauba oku tara n'ọgbaghara a. Ọstrelịa ga-achụ Kansa ọsọ ụkwụ erụala N'ofesi, mba Ọstreria eturula ugo dịka mba mbụ ga-ememina ọrịa kansa ọkpụkpụ ugwu nke akpọrọ Cervical Cancer na supirisupiri. Mba ahụ rụpụtara ọgwụ mgbochi nke ga-achụ ya bụ ọrịa ọsọ ụkwụ erụala n'afọ ịrị abụọ na-abịa. N'egwuruegwu, akwaala otu Manchester United emu Na Champions League, Manchester United eritaghi elele na obi ha ka ha na Valencia ji efu efu mechie asọmpị ha. Mana, ogbo ha bụ Manchester City ji ọkpụ abụọ asatara otu lee onwe ha ọbịa na be ndị Hoffenheim. Lee ihe nkiri anyị https://www.bbc.com/igbo/afirika-45713952 +sports Akụkọ dị mkpa taa: Enyimba agbawaala Rayon Sports anya Akụkọ dị mkpa taa Otu egwuregwu bọọlụ Enyimba ji ọkpụ goolu ise chara acha asatara otu (5-1) merie ndị Rayon Sports nke Rwanda n'asọmpi iko CAF confederation agbara taa. Ndị nyere goolu gụnyere Stanley Dimgba, Ikouwem Udo, Sunday Adetunji, Joseph Osadiaye na Isiaka Oladuntoye. A ga-emegharị ntuliaka Osun steeti Ụlọọrụ INEC ekwuputala na ntuliaka iji họpụta gọvanọ Osun Steeti e mere ụnyaahụ ezughi ezu n'ihi ọnụ ọgụgụ vootu ndị akagburu n'ụfọdụ ebe. Joseph Adeola Fuwape bụ onye gụpụtara vootu a kwuru na aga-emegharị ntuliaka ahụ n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Seputemba. Ndị ntọọrị akpara ike ọzọ Ndị ohi oke osimiri bụ Pirates na bekee wakporo ụgbọmmiri ngwaahịa nke Swiss n'oke osimiri si Legọs gawa Portharcourt ụnyaahụ. Ndị ohi a tọọrọ mmadụ iri na abụọ bụ ndị so ụgbọmmiri ahụ eme njem. Ngalaba na-ahụ maka mmekọ mba Switzerland na mba ndị ọzọ kwụrụ na ọ bụ ụlọọrụ obodo ha nwe ụgbọmmirị ahụ, ma sịkwa na ọnweghị onye be ha so na ndị aka ji. Ụgbọmmiri a bu ihe oriri Bekee kpọrọ wheat site Pọt Hacọt na-aga Legọs. Na mba ofesi, Onyeisiala mba Iran bụ Hassan Rouhani akatọọla mba Amerịka maka mwakpo emere ndị agha n'obodo Avhaz. Rouhani kwuru na ọ bụ Gulf steeti mba Amerịka na-akwado butere mwakpo a mana Amerịka agọrọla ụkwụ na aka ha. N'egwuregwu, Anthony Joshua meriri Alexander Povetkin na ọkpọ ha pịara unyaahụ na ama egwuregwu Wembly nke dị na Briten. Povetkin bịara asọmpị ahu ka ọ mara ka ọ ga-anapụ Joshua ọkwa ya dika onye tụụrụ ugo na ịpịa ọkpọ n'ụwa niile nke Bekee kpọrọ world heavyweaight title, mana Joshua pịatụrụ ya na agba nke asaa. N'asọmpi Premier league, Chelsea enweghi ike merie ndị West Ham dịka onweghi ndị nyere onwe ha goolu. Gee nkeji nke taa Ihe nkiri nke taa https://www.bbc.com/igbo/afirika-45617680 +business Electricity Generation: 'Ọ bụghị anyị ka enweghị ọkụ latrik si n'aka' - EEDC Nsogbu enweghị ọkụ latrik na Naijirịa bu ihe gọọmentị Naijiria ka kpụ n'ọnụ ma na-achọ ebe mmiri siri banye n'akị oyibo. N'izuụka Ọgọst 16, Osote Onyeisiala bụ Yemi Osinbajo were ebubo enweghị ọkụ latrik busa n'ụkwụ ụlọ ọrụ n'eke ��kụ latrik na Naịjirịa. Osinbajọ kwụrụ nke a mgbe ọ gara igbape ọdọ ọkụ Latrik nke ndị Niger Delta Power Holding Company (NDPHC) rụrụ n'Abeokuta dị n'Ogun Steeti. O kwuru na na-agbanyeghị na mkpurangwa gọọmentị nwere ugbua nwere ike imepụta ọkụ latrik nke ruru 8,000MW ma bupụ nke rụrụ 7,000MW, mana ihe na-ebe ka na-ebe. Osinbajo kwuru na nsogbu sitere n'aka ndị ụlọ ọrụ na-ekasi ọkụ latrịk nye ọha mmadụ a na-akpọ Discos n'ihi na ngwa orụ ha agaghị ebulị ọkụ latrịk gọọmentị nwere ike ibupụta. O kwuru na nke a mere ha na-ebupụta ọkụ latrik na-ebupụta nanị 4000MW nke ndị na-ekasa ya ga-ebunwu. BBC gbara ndị Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) ajụjụ maka nkea, ha sitere n'ọnụ Emeka Eze bụ onye na ekwuchitere ha were sị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-49367926 +politics Ihe i kwesịrị ịma maka Peter Obi e ji 'Okwute ndị Igbo maara "Igbo tụrụ ilu sị na onye a na-akpọ nwere ihe ọ na-eme. Etu a ka ọ dị n'ebe nwa amadị a bụ Peter Obi nọ dịka ndị mmadụ kpụ ya n'ọnụ n'ihi ihe o kwuru maka Naịjirịa ịbanye ọtanisi nke ugboro abụọ n'afọ ise. Obi kwuru na Naịjirịa chọrọ ipụta n'ọnọdụ a, na gọọmentị kwesịrị ibelata aka n'ego ha na-emefu maka bọjetị ma were ego tinye n'akụnaụba na-arụpụta ihe. Ọtụtụ ndị mmadụ nabatara ihe Obi kwuru, ebe ndị ọzọ na-ajụ ""kedụ ihe Obi mere n'ọge ọ bụ gọvanọ Anambra Steetị""? Onye bụ Peter Obi na ihe i kwesịrị ịma maka ya? Nturuugo Obi ritere ọtụtụ nturuugbo gụnyere;" https://www.bbc.com/igbo/afirika-55046945 +politics Rochas enyeela ndị Imo ezumike ọrụ maka PVC Imo steetị enweela ụbọchị ezumike abụọ! Gọvọnọ Imo steeti bụ Rochas Okorcha kwuru na ụbọchị Wesdee bụ Ọgọóst 15 na Tọọsde bụ Ọgọọst 16 ga-abụ ụbochị ezumike na steeti ha. Nke a bụ maka ị nye onye ọbụla ohere i jee nata akwụkwọ ntulaka ha nke Bekee kpọrọ PVC. Ha mere nghagharị iwe makana ha nụrụ puke puke na ndị na-achị ha chọrọ izipu ha gawa ebe ọ na-ekpo ọkụ n'agha Naịjirịa na Boko Haram. Ndị agha a jiri iwe na-agba egbe na odo ugboelu ma jụọ cha cha na a ghaghị aba ụgbọ elu ha. Mmadụ 39 anwụọla na Idlib n'ime mba Syria Na mba ofesi, akwa ohụrụ na-ebe n'obodo Idlib n'ime Syria dịka ogbunigwe si gbariri otu ụlọ nakwa gbuo mmadụ iri atọ na itoolu. Mmadụ iri na abụọ n'ime ha bụ ụmụaka. Amabeghí ihe kpatara ogbunigwe jiri gba, mana agha ka na-ada na Syria. Ihe niile mere na Premier League N'egwuregwu, Manchester City emeriela Arsenal ọkpụ abụọ na-asaghi ihe n'asọmpị Premeir League ha gbara unyahụ. Liverpool meri kwa West Ham ọkpụ anọ asatara ihe. Gee nkeji anyị n'ụtụtụ a Ihe nkiri nke taa: https://www.bbc.com/igbo/afirika-45167341 +business Honey production: Lee ka ị ga-esi mata ezigbo mmanụ aṅụ Lee nwaamdị ji ịha mmanụ aṅụ mere akaọrụ. Ikechukwu Nwokenta kọwara ka o si ahapụta mmanụ aṅụ nakwa mkpa ọ dị na ndụ mmadụ. Ọ kọwara otu esi amata ezigbo mmanụ aṅụ na nke adịgboroja. O kwukwara ụdị ọnọdụ dị mma ị nọ kwee ọnya anụ. Kirie ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58062405 +health Etu soshal midia si mee ka ọ dị mfe ire ọgwụ ike Ị hụtụla onye ọgwụ ike na-enye nsogbu maọbụ onye o gburu? A chọpụtala na e nwere ụzọ ndị omekome na-esi eji soshal midia eresị ndị mmadụ ọgwụ ike ha. Nchọpụta a gosikwara ihe ndị ụlọọrụ soshal midia gụnyere Snapchat na Instagram na-eme gbasara ya. Ezinaụlọ ndị ụmụ ha na ụmụnne ha si na soshal midia zụrụ ọgwụ ike a kwuru na ha chọrọ ka ndị ụlọọrụ soshal midia ndị a gbakwuo mbọ hụ na ha kpachiri ụzọ niile ndị omekome a si eme ihe a. Kedụ ihe ndị uweojii nwere ikwu maka ya? Chọpụta site n'ile ihe nkiri a n'uju ebe a: https://www.bbc.com/igbo/afirika-53926995 +health Covid 19 n'otu nkeji: Yabas, jinja maọbụ galik o nwereike inye aka ịgwọta coronavirus? Kedụ ihe ikwesiri ịma maka ịta jinja, galik maọbụ yabas? Ndị mmadụ ga-asị taa jinja, galik maọbụ yabas ka o nwereike inye aka ịgwọta Coronavirus, mana gịnị ka ndị WHO kwuru maks nke a? Ihe onyoonyo a ga-akọwara gị ha niile, kirie ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52100231 +religion Nchọpụta egosila na Pope Benedict XVI emeghi ihe ọbụla maka mkpesa mmetọ ụmụaka anọ e kpesaara ya "Nchọpụta egosila na enweghi ihe Pope Benedict nke iri na isii bụbu onyeisi ụka Katọlik, mere maka okwu mwakpo ụmụaka anọ e kpesara n'aka ya oge ọ bụ Achbishọp nke Munich. Pope Benedict nọ n'ọkwa ahụ site n'afọ 1977 ruo 1982, agbụrụla aka ya n'ebubo ahụ mere mgbe ahụ ọ na-abụbeghi Pope. Otu ụlọọrụ ndị ọkaiwu nọ na mba Jamini bụ ndị nzukọ Katọlik goro ka ha mee ya bụ nchọpụta. Ha sị na nchọpụta ha gosiri na ya bụ Poopu aha ya bụ Josef Ratzinger mgbe ahụ, nọ n'ụlọ ya bụ ewu mụọ n'ọgbụ n'aka ụmụaka anọ ahụ. Nke ka njọ bụ na ndị ụkọchukwu mere arụ a ka nọkwa n'ụka na-ekpori ndụ ka ọ nweghị ihe mere. Poopu Benedict XVI gbara afọ 94 ugbua, bụ Poopu mbụ gbara arụkwaghị m kemgbe afọ narị isii (600), mgbe o mere ya n'afọ 2013. Ọ sị na ọ bụ maka ike ọgwụgwụ ka ya ji tinye ya bụ akwụkwọ arụkwaghị m. Ndị ọrụ wepụtara ya bụ akwụkwọ nchọpụta bụ ndị a kpọrọ Westpfahl Spilker Wastl n'asụsụ Jamini. N'ime ya, Ọkaiwu Martin Pusch kwuru na, ""ikpe abụọ maka mmetọ ụmụaka a mere mgbe ọ nọ n'ọchịchị nke steeti kewapụrụ ndị mere ya. N'ikpe abụọ ahụ ndị kpara ya bụ arụ ka nọ n'ụka"". Otu mgbe, e boro ya na ọ ma maka otu ụkọchụkwụ metọrọ nwa nwoke bụ ndị ezitere na dayọsis ya, mana onweghị ihe o mere fada ahụ. Akụkọ kwuru na Poopu Benedict edegarala ndị ọrụ nchọpụta a ọtụtụ akwụkwọ na-aja ha ike maka ezigbo ọrụ ha ma gọọ na ụkwụ na na aka ya emetụghị ụtụ chara acha na ya bụ okwu. Akwụkwọ nchọpụta a gosiri na ya bụ Poopu nọ n'ọgbakọ ebe a na-akpa maka ya bụ okwu ma nyụọ ntị mmanụ. Ihe Vatikan mere Vatican sị na ha ga-eleba ya bụ akwụkwọ anya mgbe e biputara ya. Akwụkwọ nchọpụta ọzọ e biputaburu na-ekwụ na-achọpụtara mmetọ ndị ụkọchukwu mere karịrị 3,600 kemgbe afọ 1946 ruo 2014. Ọtụtụ n'ime ndị e metọrọ bụ ụmụnwoke ndị Bekee kpọrọ 'mass servants"". Akwụkwọ nchọpụta ọhụrụ a e mere na mpaghara Munich na Freising hụrụ na e metọrọ ihe ruru mmadụ 497 site n'afọ 1945 ruo 2019. Ọ bụghịkwa naanị Poopu a ka e boro ebubo a, ya bụ nchọpụta na-arụjere achbishọp nke mpaghara ahụ bụ Kadịnal Reinhard Marx aka ọjọọ, sị na ọ gbara nkịtị na mmetọ abụọ. Ya bụ Kadịnal etinyelarị akwụkwọ arụkwaghị m maka ya bụ ebubo kemgbe Juun afọ 2021, sị na ya kwesịrị ịketa n'ụta mmetọ ndị a, mana Pope Francis ekweghị anabata akwụkwọ ya. Mana mgbe gara aga Pope Francis emegharịala iwu e tiri maka imetọ ụmụaka, ime ka ahụhụ so ya tawanye akpụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60073671 +politics Anambra election 2021: Ihe 5 nwere ike isi ebe a na-atụ vootu kpọga gị mkpọrọ "Ka ị na-akwado ịga ebe ị ga-ebinye aka n'akwụkwọ vootu, ị ma ihe ndị ị na-ekwesịghị ime ma i ruo ebe a na-eme ntuliaka? Ntụliaka a nwere ike ịbụ nke mbụ ị na-esonye maọbụ ọ bụrụ na i sonyela na ntuliaka ugboro ugboro, mana ị ma ihe ndị nwere ike ibutere gị nsogbu n'ọgbọ ntuliaka? Dịka otu na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) siri kwuo, ime ihe ise a n'ọgbọ ntuliaka ga-ekotere gị okwu na ụka. N'agbanyeghị na ụfọdụ ndị na-ekwu na ntuliaka ọkwa gọvanọ agaghị enwe isi n'Anambra steeti, Inec na-adọ aka na ntị na ihe ndị ga-ebutere gị nsogbu ma ị mee ha taa. 1) Aghọgbula onye ọbụla na ị bụ onye ụlọọrụ Inec: Ụfọdụ oge ka ị ga-ahụ ndị na-agwa ndị mmadụ na ha na-arụrụ Inec ọrụ, mana otu abụghị n'ezi. Marakwa na aka kpara gị ka ị na-aghọgbu ndị mmadụ n'ụzọ a, ị ga-akwụ nha otu nde naịra (N1m) maọbụ ị gaa mkpọrọ otu afọ. 2) Iji akwụkwọ mbinyeaka: E jide gị ka i ji akwụkwọ mbinye aka (ballot paper) nke ị na-enweghị ikike ijide, ị mara na ị nọ n'ezigbo ofe dị ọkụ. Ọ bụrụ na adaghị gị nha ịkwụ nde naịra iri ise (N50m), ị mara na ị nwere ike ịga mkpọrọ afọ iri. 3) Iji ngwaọgụ bịa: Ụbọchị ntụliaka, ị kwesịghị iji ngwaọgụ maọbụ ihe nwere ike imerụ mmadụ ahụ bịa. E jide gị ka i ji ngwaọgụ dịka egbe maọbụ mma na ihe ndị ọzọ dị etu ahụ, ị ga-akwụ puku narị naira ise (N500k) maọbụ ị gaa mkpọrọ otu afọ maọbụ ha abụọ. 4) Inye onye ọzọ akwụkwọ ikike ntụliaka gị: Ị daala iwu ma ị nye onye ọzọ akwụkwọ ikike ntuliaka gị nke a na-akpọ ""PVC"" ka o were mee ntuliaka. Ị dakwara iwu ma ọ bụrụ na i jide PVC karịrị otu (nke bụ nke gị). E jide gị, ị ga-akwụ iwu otu nde naịra (N1m) maọbụ ị gaa mkpọrọ otu afọ. N'otu aka ahụ, ị ga-akwụ iwu otu puku narị naịra (N100k) maọbụ ị gaa mkpọrọ ọnwa isii maọbụ ha abụọ ma e jide gị ebe i ji akwụkwọ ikike ntuliaka onye ọzọ jirila mee ntuliaka. 5) Iburu ngwaọrụ e ji eme ntụliaka: E jide gị ebe ị maburula ngwa ọrụ e kwesịrị iji eme ntuliaka, ị dabanyela n'ezigbo nsogbu. Ị ga-aga mkpọrọ afọ abụọ. Ụlọọrụ Inec ji nke a dọọ ndị mmadụ aka na ntị na websaịt ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-46428648 +business MMM re-launch: Onye ọ bụla jiri ire ya gụọ eze ya ọnụ - EFCC Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commision(EFCC) dị n'Enugu bụ Chris Oluka ekwuola na MMM bụ ajọ ihe ma na-arịọ ụmụ Naịjirịa ka ha gbara atụmaatụ a ọsọ. Oluka kwuru ka ụmụ Naịjirịa jiri ire ha gụọ eze ọnụ gbasara ya bụ atụmaatụ. Gere ihe okwuru n'uju n'ihe ọkpụkpọ. Onye na-achọghị ka akpọpụta aha ya gwara BBC na o tufuru ego ruru nde naira ise na ụma, kwuru na MMM agaghị eme ọfụma dịka ndị nwe ya malitere ya ọzọ. O kwuru na ọ ga-echefu ego niile o tufuru tupu MMM emechie na mbụ gbara ya bụ atụmaatụ ọsọ. O kwuru na dịka onye gbagotere n'ọkwa mgbe mbụ MMM pụtara, na ọ ga-adụ ụmụ Naịjirịa ọdụ ha abanyekwala atụmaatụ a ọzọ. Mana onye ọzọ ji ego o ritere na MMM ruru nde atọ wee zụta ala kwuru na ya ga-abanye ọzọ. O kwuru na ọ bụ akọ na uche ka eji abanye MMM makana a ga-enwerịrị ndị ọ ga-akwa na ndị ga-erite uru na ya bụ atụmaatụ. Kamgbe ụlọọrụ MMM depụtachara n'akara webụsaiti ha na ha malitela ọzọ, lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu soshal media.‏ @EmyOputa kwuru na ọ bụrugodi na ha apụtara ọzọ n'ezie, na ya agaghị etinye aka ebe ahụ ọzọ. @Ojjobalo kwuru na ọchị na-atọ ya makana ndị mmadụ amụrụla akọ Mana ‏@am_daboss kwuru MMM abiala ịnọdụ. @aliyyzacs kwuru ka gọọmenti etiti nyocha ha ọfụma. @Da1aniekan kwuru na ọ gaghị abanye ọzọ ma ncha ma ncha. @VICKNNADI1 na-arịọ ụmụ Naịjirịa ha ekwela ka a rafuo ha ọzọ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48735845 +health "Broken Heart Syndrome: Ị ma na ""Obi Mgbawa"" nwere ike ibutere gị ọnọdụ a?" "Ọtụtụ mgbe ka ị na-anụ ndị mmadụ na-ekwu okwu dịka ""i mewaala m obi"", maọbụ ""obi agbawaala m"". Ndị mmadụ na-ekwukarị ụdị okwu a ma onye ha hụrụ n'anya mee ha ihe wutere ha nke ukwuu. Mana ọtụtụ amaghị na e nwere ọnọdụ ahụike a na-akpọ obi mgbawa, maọbụ 'Broken Heart Syndrome' na bekee. Akụkọ a bụ iji kọwaa ihe bụ 'Broken Heart Syndrome', ihe nwereike ịkpata ya, etu o si enye mmadụ nsogbu nakwa etu mmadụ ga-esi zeere ya. Gịnị bụ Broken Heart Syndrome? Dọkịta Chioma Ofoekii kọwara 'Broken Heart Syndrome' dịka mgbe obi mmadụ nwere nsogbu ma rụhie ọrụ nwa mgbe nta. Ihe na-akpata ụdị ọnọdụ a nwereike ịbụ nnukwu ihe mwute maọbụ ihe mere mmadụ na mberede, dịka ihe obi mwute, nnukwu ihe ịtụnanya, oke iwe, maọbụ nnukwu ihe ịtụ egwu. Ihe ndị ọzọkwa nwere ike ịkpata ya bụ shuga dị n'ọbara mmadụ ịdatu ala karịa etu o kwesịrị, ọbara ịgbapụ mmadụ n'ahụ nke ukwuu, maọbụ oke ahụ ọkụ. Mmadụ nwereike inwe ụdị ọnọdụ a bụ 'Broken Heart Syndrome' maọ bụrụ na ahụ mmadụ mepụta nnukwu 'adrenaline' ma ihe dị aṅaa mee. 'Adrenaline' bụ akụrụngwa ahụ mmadụ na-emepụta iji nye aka kwadoo onye ahụ maka ihe ụfọdụ. Aha ọzọ a na-akpọ ọnọdụ ahụike a bụ ""Stress cardiomyopathy"" ""Takotsubo syndrome"", maọbụ ""Apical ballooning syndrome"". Dịka Dọkịta Ofoekii si kọwaa, ọnọdụ a bụ 'Broken Heart Syndrome' na-egosipụta n'ụdị dị icheiche dịka: Dkt Ofoekii kọwakwara na ihe ngosi ndị a bụkwa njirimara ụdị ọrịa obi dị icheiche, nke mere o ji dị mkpa ka mmadụ gaa ụlọọgwụ mgbe ọ chọpụtara ihe dị otu a n'ahụ ya. ""Onye nwere ọnọdụ ""Broken Heart Syndrome"" nwere ike inweta onwe ya ma gbakee na mkpụrụ ụbọchị olemole,"" Ofoekii kwuru. Dkt Ofoekii kọwara na ndị ọnọdụ a na-aka emetụta bụ ụmụnwaanyị, ọ kachasị ndị gaferela oge ịhụ nsọ ha nke bekee kpọrọ 'menopause'. Ọ bụ eziokwu na achọpụtala ọnọdụ 'Broken Heart Syndrome' n'ahụ ụmụ agbọghọ, ụmụ nwoke nakwa ụmụaka, mana nnyocha gosiri na ndị na-enwekarị ụdị ọnọdụ a bụ ụmụnwaanyị gbagoterela n'afọ. Ọ na-emetụtakarị ndị nwerela ọnọdụ oke obi mmapụ (anxiety), obi ịda mba (depression) nakwa ọnọdụ obi ndị ọzọ. Dkt Ofoekii gara n'ihu kwuo sị: ""Ọ bụ eziokwu na onye nwere ọnọdụ 'Broken Heart Syndrome' nwereike ịgbake, mana ya bụ ọnọdụ nwekwara ike ibute ọnọdụ obi ndị ọzọ nwereike ibute ọnwụ mmadụ. Ọ bụghị ọnọdụ mmadụ ga-eji egwuri egwu."" Nnyocha sayensị gosiri na ọnọdụ 'broken heart syndrome' anaghị egbukarị mmadụ. Mana nnyocha gosikwara na o nwere ike ịkpata ọnọdụ obi ka njọ nke nwere ike igbu mmadụ. Otu nwaanyị aha ya bụ Momma Sophia na Twitter kwuru na ya bụ ọrịa gburu nna ya. O kwuru na nwanne ya nna nwụrụ Onye ọzọ aha ya bụ Chloe, dekwara etu nna ya si nwụọ n'ihi obi mgbawa n'ọnwa June 2019." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61411603 +politics Election 2019: Gịnị bụdị inconclusive? "Otu n'ihe tụrụ ụmụ Naijria n'anya na ntuliaka gọvanọ afọ 2019 e mere na nso nso bụ na mpụtara ntuliaka e mere n'ebe ụfọdụ dị dịka Inec siri kwupụta 'inconclusive' na Bekee. Steeti ndị a bụ Adamawa, Kano, Sokoto, Bauchi nakwa Platu steeti. Kemgbe nke a mere ya bụ okwu bụ 'inconclusive"" bụzị okwu ndị mmadụ ji ekwu okwu, ebe ụfọdụ amaghị ihe ọ pụtara. Gịnị bụ 'inconclusive? Onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Ọkaiwu Ifeanyi Ulumma kọwara na ntuliaka ịdị ""inconclusive"" pụtara ""ebe e mere ntuliaka a na-emerughị n'isi."" Kedụ mgbe a ga-asị na emerụghị ntuliaka n'isi? Olisa Agbakoba bụ nnukwu ọkaiwu a ma ama na Naijiria kwuru na onye meriri abụghị naanị na o nwere vote kachasị, ọ ga emeri na imirikiti mpaghara dị icheiche ebe e mere ntulika aka ahụ. Ụzọ abụọ ntuliaka nwere ike bụrụ ihe erughị n'isi dịka Agbakoba na Ulumma siri kwuo bụ: 1. Ọ bụrụ na ihe onye meriri ji ka onye o meriri ehighị nne, ọkachasị ma ọ bụrụ na vootu a kagburu dị nnukwu. 2. Ọ burụ na e nwere ọgbaghara, ebe ihe agaghị n'anya ya dịka ebe e nwere nsogbu izu igbe vootu N'ihe mere n' Adamawa, Kano, Sokoto, Bauchi nakwa Platu steeti, Ulumma na Agbakọba rụtụrụ aka na ' Ọ dị ka ebe ndị PDP na-emeri ka a kpọpụtara dịka ""inclonslusive."" Ulumma dụrụ Inec ọdụ si ha ha leruo anya ma nye onye ọbụla meriri mmeri ma ọ bụ onye APC, APGA maọbụ onye pati ọzọ, ha nye ya onye meriri."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-47541671 +politics PVC Collection: A hụghị ndị ọrụ Inec ebe ndị ha sị na ha na-eke PVC "Ụlọ ọrụ Independent National Electoral Commission ngalaba nke Enugwu ekwuola na ọ bụ PVC ndị a gbara n'afọ 2014, 2015 rue 2021 ka ụlọọrụ ha na-eke ugbua, dịka ọnụ na-ekwuru Inec n'Enugwu si kwuo. Ozi ha wepụtaburu kwuru na iwere PVC ga-amalite ụbọchị 12 nke ọnwa Novemba wee ruo 19 nke November 2022. Ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya inweta akwụkwọ atumvootu ha denyere aha maka ya na ọnwa ole na ole gara. Mana ọnụ na-ekwuru Inec n'Enugwu bụ Maazị Eze gwara BBC na mkaprịtaụka sị, ""Anyị ebidobeghị kewa PVC ndị a gbara na 2022."" ""Anyị na-eke kaadị ndị e weghị kemgbe 2011,2014,2015,2019 na ndị e debanyere aha na June 28, afọ gara aga rue Jenụwarị afọ a."" Ndị ọrụ anyị nọcha na wọọdị 60 dị n'Enugwu ebe ahụ a gbasara aha ndị aha ha dị n'akwụkwọ."" Ọ gara n'ihu kọwaa na PVC ndị e debanyere aha ha malite n'ọnwa Jenụwarị afọ rue Julai 2022, anyị na-atụ anya inata PVC maka nkesa na ngwụcha ọnwa Novemba, afọ a. Mana BBC gagharịrị gburu gburu Enugwu wee hụ na o nweghị center ebe INEC na eke ya bụ pvc.\nOkwuchite ọnụ INEC Enugwu bụ Maazi Eze, nyere anyị aha ọtụtụ ward ebe ọ sị ha nọ eke ya bụ PVC.\nMana onye ntakụkọ anyị gagharịrị ebe ndị ahụ nakwa ebe ndị ọzọ kwuru na o nweghị ebe ndị ọrụ Inec na-eke PVC dịka ozi ha si kwuo. N' Assumption Parish Nkwo Nike Enugwu, anyị hụrụ ọtụtụ mmadụ na-eche ka Inec malite kewa ya bụ ihe.\nNwada Gloria Edeh gwara BBC na ya na-abịa ka mgbe abalị12 nke ọnwa Novemba mana o nweghị onye Inec ha hụrụ. BBC Igbo gakwara n' Okpara Square nakwa ụlọụka 'St Barth's dịkwa n'Enugwu were gbaa aka ebe na ndị INEC anọghị ebe ahụ. Nigeria ga-eme ntuliaka onyeisiala nakwa ụlọ omeiwu n'ọnwa Februwari, Afọ 2023. Dịka ntuliaka 2023 na-abịa nso, ọtụtụ ụmụ Naijiria , ọkachasị ndị na-eto eto, denyere aha ha na nsonso a iji nweta ohere isonye ịtụ vootu n'afọ 2023." https://www.bbc.com/igbo/articles/c3g4vz53p9ko +business Okonjo-Iweala WTO: Ngozi Okonjo-Iweala azọchiela na Naijiria "Onyeisi otu 'World Trade Organisation'(WTO) bụ Ngozi Okonjo-Iweala emeela njem ya mbụ na Naijiria kemgbe ọ banyere n'ọkwa ya taa bụ Satọde. Okonjo-Iweala bụ onye odeakwụkwọ Ministrị na-ahụ maka azụmahia nabatara n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja gwara ndị ntaakụkọ na ya bịara ikele onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekele maka ikwado ya. A na-atụ anya ọ ga-ezutekwa onyeisi ụlọakụ etiti, mịnịsta na-ahụ maka ego na ndị isiọrụ nwere agba ụbọchị Monde. Ngozi Okonjo-Iweala ga-ebido ọrụ dịka onyeisi World Trade Organisation taa bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Maachị 2021. Cheta na ọ bụ nwaanyị mbụ na-enwete ọkwa a mabụrụkwa onye Afịrịka mbụ nweterela ọkwa a. Lee ka ụlọrụ WTO si nabata Ngozi Okonjo- Iweala dịka ọ ga-amalite ọrụ taa ebe ahụ. Lee mgbe Okonjo -Iweala were oche ya dịka onyeisioche WTO na ọgbakọ mbụ ya o mere ebe ahụ taa ọ malitere ọrụ. Ndị ntaakụkọ nabatara Ngozi Okonjo Iweala mgbe o bidoro ọrụ. Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na o doro ya anya na Ngozi Okonjo Iweala ga-arụ ọrụ ya dịka onyeisi World Trade Organization (WTO) ọfụma. Nke a pụtara ihe n'ozi oziputere iji bunye ya ụkpa ekele maka ịnweta ọrụ ahụ nke WTO kpọpụtara n'ụbọchị Monde. Ihe ọzọ onyeisiala kwuru n'ozi ya bụ na Okonjo-Iweala wetara aṅụrị nakwa nkwanye ugwu nyere mba Naịjirịa. Ndị ọzọ kelere Okonjo-Iweala ekele pụrụiche maka ọkwa ọhụrụ a gụnyere Peter Obi, Bukola Saraki nakwa odogwu nwaanyị n'ụlọakụ mbaụwa bụ Christine Lagaard. Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwụ na Naịjirịa ekeelela Ngozi Okonjo-Iweala Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwụ na Naijirịa egosila afọojuju ha ebe Ngozi Okonjo-Iweala nọ maka ọrụ ọhụrụ ọ nwetere. Mmadụ dịka Pat Ụtọmị kelere agụ nwaanyị Igbo a ebe ọ dị ukwu maka ịhe mba nweta ya bụ mmerị lọta. Ọ rịọrọ Okonjo Iweala ka ọ ghara ịkpaoke ma oruo ebe ahụ. N'olu ya, ọ sị isi okwu ya n'ọrụ ahụ ga-abụ ""egbe bere, ugo bere. Onye aghala nwanne ya"". Gọvanọ Legọs steetị bụ Babajide Sanwo-olu bunyekwara Okonjo Iweala ụkpaekele maka oche ọhụru e bunyere ya na WTO dịka o kwuru na Twitter ya. N'otu aka ahụ, Ifeanyi Okowa bụ Gọvanọ Delta steeti bunyekwara ya ụkpaekele na-ekwe ya nkwa na ya ga-akwado ya nke ọma ma n'ụlọ ma n'ezi. Onye bụbo Gọvanọ Anambra steeti bụ Peter Obi sokwa na ndị bunyere Okonjo-Iweala ụkpaekele. Onye bụbu osote onyeisioche Sineti oge agara aga bụ Abubakar Bukola Saraki sokwa jaa ya mma na ndụ maka ya bụ agụ Okonjo-Iweala gburu. Agụ nwaanyị International Monetry Fund (IMF) bụ Christine Lagarde bunyekwara ya ụkpaeke sịkwa na ya ji n'aka na Okonjo-Iweala ga-eme ihe e ji mara ya ebe ahụ. World Trade Organisation akpọpụtala Ngozi Okonjo-Iweala nke Naịjirịa dịka onye ga-anọ n'isi ụlọọrụ ha. Ha depụtara nke a n'akara Twitter ha n'ehihie Monde. Okonjo-Iweala bụ nwaanyị mba ga-anọ na ya bụ oche bụrụkwa onye Afrịka mbụ. Ọ ga-amalite ọrụ ya n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Maachị wee ruzie 31 August, 2025. WTO kpebiri nke a n'ọgbakọ puruiche ha nwere ebe ha nọ tinyere ọnụ na ya bụ mgba Okonjo Iweala na mmadụ asaa ndị ọzọ gbara. Ndị mmadụ tụmadụ ụmụ Naịjirịa adịla njikere maka mkpọpụta Ngozi Okonjo Iweala bụbụ minista na-ahụ maka akụ na ụba na Naịjirịa dịka onyeisi World Trade Organisation. Okonjo Iweala ga-abụ nwaanyị mbụ nakwa onye Afịrịka mbụ ga-enweta ọkwa a kamgbe ehibere ya. Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ i kwesiri ịma maka agụ nwaanyị a: Ngozi Okonko-Iweala na-ekwusi ike na ọ ga-enye ngalaba WTO anya zuru oke dịka ọ na-ekwukwa na ihe gbasara azụmahịa bụ ihe o ji obi ya niile eme. Onyeisiala mba Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekelela mba Amerịka maka nkwado ha nyere Ngozi Okonjo Iweala n'ịzọ ọkwa onyeisi WTO. O kwuru nke a n'ozi o depụtara n'akara Facebook ya ma kwuo na obi juputara mba Naịjirịa nakwa ala Afrịka niile na nke a. ""O gosiri na mba Naịjirịa na Amerịka kwụ otu ebe n'ịnabata onye ala anyị na-emepụta anyị ihu bụ NOI"" ka o kwuru. Cheta na Mba Amerịka nyere Ngozi Okonjo-Iweala nkwado ha maka ịbụ onyeisioche otu 'World Trade Organisation'. Mba Amerịka enyela Ngozi Okonjo-Iweala nkwado ha maka ịbụ onyeisioche otu 'World Trade Organisation'. Amerịka nyere nkwado a site n'akwụkwọ ozi si n'aka ngalaba mba ahụ n'ahụ maka ahịa. Akwụkwọ ozi a kwuru sị: ""Ọchịchị Biden na Harris ji ọbị ọma na-ekwupụta nnukwu nkwado maka Ọkammụta Ngozi Okonjo-Iweala dịka ọ na-azọ ọkwa onyeisioche WTO."" ""Ọchịchị Biden na Harris na-ekelekwa Yoo Myung-hee maka mbọ ọ gbara ịzọ ọkwa a. Amerịka anabatala mkpebi ya iwepụ onwe ya na ya bụ ndọrọndọrọ."" Cheta na Amerịka enyebughị Okonjo-Iweala nkwado oge onyeisiala Donald Trump nọ n'ọchịchị, kama ha kwadoro Yoo Myung-hee, mana egwu adagharịala ugbua. Okonjo-Iweala kelere mba Amerịka nakwa Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari maka nkwado ha nyere ya iji nweta ọkwa onyeisioche WTO. Ngozi Okonjo-Iweala nke Naịjirịa bụ otu onye fọrọ n'izọ ọkwa World Trade Organization (WTO) adịla njikere ibu onyeisi otu ahụ. Nke a na-abịa dịka nwafọ mba Saụt Korịa bụ Yoo Myung-hee na-ama ya aka esepụla aka ya n'izọ ọkwa ahụ nke mere o ji fọ naanị Okonjo-Iweala. Ndị nnọchịteanya isiọchịchị otu WTO kwadoro ka Okonjo-Iweala bụrụ onyeisi otu a n'ọnwa Ọktoba afọ 2020. Tupu nke ahụ emee, Okonjo-Iweala na Yoo- Myung-hee bụ ụmụnwaanyị abụọ ọ fọrọ n'ịzọ ọkwa onyeisi otu ahụ nke bụ mbụ ọ na-eme kamgbe e hiwere ya. Onye nnọchiteanya mba Amerịka n'otu bụ nke onyeisiala Joe Biden họpụtara ka na-eche nyocha n'aka ndị omeiwu Amerịka. Ihe mere Ngozi Okonjo-Iweala eburubeghi oche eze na WTO Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ mba so n'otu 'World Trade Organisation' kwadoro Ngozi Okonjo-Iweala mana nke a ezubeghi iji akpọpụta ya dịka onyeisi ọhụrụ otu a. Okonjo-Iweala sepụtara isi dịka onye nwereike ịbụ onyeisi otu WTO ọhụrụ ndị nwere agba n'otu WTO nyere atụmatụ ka Okonjo-Iweala bụrụ onyeisi ha. Ndịisi atọ na-anọchiteanya otu WTO a kpọrọ 'Troika' kwadoro Okonjo-Iweala mana a na-eche ka mmadụ 164 so n'otu a kwadoo mkpebi a. Site na ntuliaka e mere n'ụbọchị Wenesde 28 Ọktoba, 2020, Okonjo-Iweala nwetere nkwado kachasị mana mba Amerịka akwadoghi ya. Ndị na-ekwuchitere Okonjo-Iweala ọnụ sị na obi dị Okonjo-Iweala ụtọ na nkwado e nyere ya mana ọ na-eche ka a kpọpụta aha ya n'ụbọchị 9 Nọvemba, 2020. A na-atụ anya na ndị otu a ga-akpọ aha mgbe ndị otu a ga-ezuko inwe nkwekọrịta tara ọchịchị n'etiti ha. Ọ bụrụ na nke a mee, Okonjo-Iweala ga-abụ nwaanyị mbụ n'ụwa nakwa Afrịka ga-anọ n'ọkwa a kamge afọ 25 e hiwere otu a. Gịnị mere Amerịka akwadoghi Okonjo-Iweala? Dịka onye ntaakụkọ BBC n'okwu akụnaụba bụ Andrew Walker si kwuo, mba Amerịka kwadoro ka Myung-hee nke Korịa maka na ""o nwere ahụmihe n'azụmaahịa mba na mba nakwa etu o si agbapụ ọzọ n'ime ihe"" Ha ekwughi kpọmkwem ihe mere ha akwadoghi Okonjo-Iweala. Otu 'World Trade Organisation' ewepụla mmadụ atọ so azọ ọkwa onyeisi otu ma hapụ Okonjo-Iweala n'ọsọ oche ahụ. WTO wepụrụ Jesus Seade nke Mexico, Hamid Mamdouh nke Egypt nakwa Tudor Ulianovschi nke Moldova n'agba nke mbụ n'ime atọ nke atụmvootu ha. N'ozi WTO wepụtara n'akara Twitter ha, ha kwuru na ""ndị ga-abanye agba nke abụọ na ntule onye ga-abụ onyeisi WTO gụnyere Ngozi Okonjo-Iwela(Nigeria); Yoo Myung-hee(Korea;Amina C Mohammed(Kenya, Mohammad Maziad Al-Tuwaijri (Saudi Arabia) na Liam Fox(United Kingdom). A ga-eme ya bụ agba nke abụọ ntule n'abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Septemba, ebe nke atọ ebe a ga-ekwupụta mmadụ abụọ fọrọ n'ọsọ ikpeazụ ga-abụ abalị isii nke ọnwa Oktoba. Lee ndị chere Ngozi Okonjo-Iweala aka mgba maka ọkwa onyeisi WTO Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-ekpe ekpere ka Ngozi Okonjo-Iweala bụrụ onye nchịkọta otu ahịa mbaụwa a kporọ 'World Trade Organisation' na Bekee. Okonjo-Iweala bụ nwa ada ude ya na-ede na mbaụwa niile n'ihi etu ụbụrụ ya si acha ọkụ. Ọ rụọla ọrụ ugboro abụọ dịka Mịnịsta na-ahụ maka ego na Naịjirịa oge Olusegun Obasanjo nakwa Goodluck Jonathan bụ onyeisiala. Ọ bụkwara osote onyeisi ụlọakụ mbaụwa (World Bank), ma nọrọkwa n'isioche ọtụtụ ụlọọrụ na ngalaba a ma aha ha n'ụwa. Ndị a gụnyere Twitter, Gavi, ụlọakụ 'Standard Chartered', dịrị gawazie. Mana mmadụ asaa ọzọ egosikwala mmasị ha iso Okonjo-Iweala zọọ ọkwa 'Director General' nke WTO. O lee ndị ka ha bụ? 1) Jesús Seade Kuri (Mexico) Kuri bụ onye kacha mee okenye n'ime ndị niile so azọ ọkwa a. Ọ gbara afọ iri asaa na atọ (73). Kuri arụọla ọrụ na WTO, 'International Moonetary Fund' nakwa n'ụlọakụ mbaụwa (World Bank). Ọ rụkwaala ọrụ na gọọmentị Mexico. 2) Abdel-Hamid Mamdouh (Egypt) Ọ bụ onye ọkaiwu nakwa ọka nkuzi a ma ama. Mamdouh arụkwaala ọrụ na WTO, ma bụrụkwa onye nọchiri anya mba Egypt n'okwu azụmahịa na mba Ethiopia, Switzerland, nakwa Australia. Ọ gbara afọ iri isii na asatọ (68). 3) Yoo Myung-hee (South Korea) Myung-hee bụ nwaanyị nke mbu rụrụ ọrụ dịka Mịnịsta azụmahịa nke mba South Korea Ọ gbara afọ iri ise na atọ (53) Ọ rụọla ọrụ ihe gbasara azụmahịa mbaụwa ruo afọ iri abụọ na ise (25) O so na ndị nyere aka hazigharịa azụmahịa mba Korea ka ọrịa coronavirus ghara imekpa ha ahụ. 4 Tudor Ulianovschi (Moldova) Onye nke a bụ onye kacha dụrụ nwata n'ime ndị niile na-azọ ọkwa onye nchịkọta otu WTO. Ọ gbara naanị afọ iri atọ na asaa (37). Tudor rụburu ọrụ dịka Mịnịsta hụrụ maka mmekọrịta mba Moldova na mba ndị ọzọ, nke Bekee kpọrọ 'Foreign Affairs'. Ọ rụkwara ọrụ dịka onye nnọchite anya mba ahụ na Switzerland na Liechtenstein. 5) Amina C. Mohamed (Kenya) Onye nke a abụghịkwa Amina Mohammed nke rụburu ọrụ dịka Mịnịsta na-ahụ maka gburugburu (environment) na Naịjirịa, ọ bụ onye Kenya. Amina arụọla ọrụ nke ọma n'otu WTO dịka onyeisioche ọgbakọ ọha (General Council), nakwa onyeisi oche ngalaba na-ekpezi esemokwu nke Bekee kpọrọ 'Dispute and Settlement Body'. Ọ rụkwaala ọrụ dịka Mịnịsta na ngalaba dị icheiche na gọọmentị mba Kenya. Amina gbara afọ isi ise na asatọ (58). 6) Mohammad Maziad Al-Tuwaijri (Saudi Arabia) Mohammed bụ mịnịsta na-ahụ maka nhazi akụnaụba na Saudi Arabia. Ọ bụkwa onye na-akwọ ụgbọelu (pilot) ma bụrụkwa onye ọrụ ụlọakụ n'oge gara aga. Ụlọakụ ebe ọ rụburu ọrụ gụnyere 'Saudi British Bank', J.P.Morgan nakwa HSBC. Ọ dị afọ iri isii. 7) Liam Fox (United Kingdom) Fox gbara afọ iri ise na asatọ (58) Ọ rụrụ ọrụ dịka ode akwụkwọ ukwu na-ahụ maka azụmahịa n'oge Theresa May bụ Praịm Mịnịsta mba UK. A mụrụ ya na Scotland, ọ gụọ akwụkwọ na Mahadum Glasgow ebe ọ natara ọzụzụ dịka dịbia bekee. Ọ rụrụ ọrụ dịka dọkịta na ngalaba ahụike mba UK a kpọrọ 'National Health Service'. Roberto Azevedo, onye ji ọkwa 'director general' nke otu WTO ugbua, ekwuola na ya ga-aritu na ngwụcha ọnwa Ọgọst afọ 2020. Ọ bụ afọ anọ ka mmadụ na-anọ na ya bụ ọkwa, mana e nwere ike inye mmadụ ohere ka ọ chịa nke ugboro abụọ. E tinyere Azevedo n'ọkwa ahụ n'afọ 2013, ma nyekwa ya ohere nke abụọ na 2017. Mana o kwuru na ya agaghị eche ka oge ya gwụ na 2021 tupu ọ rituo. Ọ bụ mba dị iche iche ga-ahọpụta onye nke ha chọrọ ka ọ chịa otu WTO. Nhọpụta a akwụsịla n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Julaị. Ndị a họpụtara ga-amalite igosipụta onwe ha nakwa ịgwa ọha obodo ihe ha bu n'obi ime ma ha nweta ya bụ ọkwa. Agba nke a ga-akwụsị n'ụbọchị asaa nke ọnwa Sepụtemba. Nke a gachaa, ndị ọnụ na-eru n'okwu ga-amalitezi ọgbakọ ebe ha ga-anọ tulee ndị niile a họpụtara ma jụọ ese niile ha kwesịrị ịjụ. Agba nke a na-ewe ihe dịka ọnwa abụọ. N'ikpeazụ ka ha ga-ahọpụtazi onye meriri ya bụ asọmpi." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53410699 +health Cerebral Malaria: I ma maka ọrịa iba na-aba n'ụbụrụ "Iba bụ ọrịa na-emetụta ọtụtụ ndị mmadụ na mba ụwa. Ngalaba ahụike mba ụwa bụ World Health Organization (WHO) kwuru na ihe kariri mmadụ nde nari abụọ na puku iri anọ na otu butere ọrịa n'ụwa niile n'afọ 2020. WHO kwukwara na mmadụ ole ọrịa a dulara mmụọ kariri puku nari isii na ụma n'afọ 2020. Ọrịa iba bụ ọrịa mmadụ nwereike ibute ma anwụnta taa ya maobụ anụ anwụnta tara taa ya. Ọrịa a na-aka ememina ụmụnwaanyị dị ime, ụmụaka, ndị okenye na ndị na-arịa ọrịa kụkasịrịla ime ahụ ha dịka ọrịa obirinayaọcha (HIV/AIDS). Ọrịa iba na-ebute: * Ahụ ọkụ * Isi ọwụwa * Oyi ịtụ mmadụ * Ahụ mgbụ na ọkpụkpụ igbuji mmadụ Ọrịa iba nwere ọgwụgwọ, ụfọdụ n'ime ha bụ ọgwụ pụrụiche onye bu ọrịa a nwereike ịṅụ ma gbakee n'abalị atọ maọbụ anọ. Ndị dọkịnta na-akpọ ọgwụ ndị a ""Antimalaria Drugs"". Ngwa gee ntị ka a kọwara gị maka ya. Ọrịa iba na-aba n'ụbụrụ na-amalite dịka ọrịa iba nke nkiti, ọ bụkwa anwụnta bụ ihe na-ebunye mmadụ ọrịa a. Otu nọọsụ gbatagbata na mba Amerịka aha ya bụ Olayinka Akinsanya gwara BBC Igbo etu ọrịa a si aba n'ụbụrụ mmadụ, o kwuru: ""Ọ bụrụ na mmadụ buru ọrịa iba ma hapụ ilebara ya anya ruo oge ole m ole, nje ọrịa nwereike ibuso ihe na-ebu nrị na ikuku agaghari n'ọbara mmadụ nke Bekee na-akpọ'red blood cells'agha. Ọ bụrụ na nje ọrịa buso ya agha, ọ nwereike ime ka ọ kpachie ụzọ ọbara si abanye n'ụbụrụ mmadụ, nke a ga-akpalite ka ụbụrụ onye ahụ malite iza aza"" O kwukwara na ọ bụrụ na nke a mee, a ga-amalite ịhụ ọtụtụ ihe igbaama ga-egosi na ọrịa a abanyela ụbụrụ onye ahụ dịka: * Mmadụ ịnọ n'etiti ọnwụ na ndụ, ọnọdụ a bụ nke Bekee na-akpọ 'Coma' * Akwụkwụ ịdọ mmadụ * Mmadụ ikọgheri akọgherị Ndị ọrụ ahụike kwuru na ọnọdụ ọrịa nwereike imebi ụbụrụ ụfọdụ ma agwọcha ya bụ ọrịa iba nke bụ na ụbụrụ ndị ahụ aghaghịzị ezu oke ma ha gbakee. Marakwa na dịka ọrịa iba nke nkiti onye bụ nke a na-aba n'ụbụrụ ga egosi ihe igbama na-ahụ ya dịka ahụ ọkụ, isi ọwụwa, oyi ịtụ mmadụ, ahụ mgbụ wdgz. Usoro ọbụla ga-egbochi anwụnta ita mmadụ bụ usoro ga egbochi ọrịa a. Usoro ndị a ka nkụ nke gụnyere: 1. Gba mbọ dobe akụkụ be gị ọcha, sụcha ọhịa niile nọ gị nsọ maọbụ ebe ọbụla anwụnta nwereike ibi 2. Kwuchịe maọbụị bupụ iko mmiri ọbụla ebe anwụnta nwereike ibi maọbụ mmụbawanye 3. Na-agbachi ụzọ be gị na ebe ikuku si abata dịka ebe ndị bụ ebe anwụnta si efebata be mmadụ 4. Gba mbọ zụta akwa pụrụiche na-egbochi anwụnta ita mmadụ nke Bekee nba-akpọ ""Mosquito Net"" 5. Gba mbọ tinye akwa mgbochi a n'ebe ikuku si abata be gị dịka nke a ga-egbochi anwụnta ifebata be gị 6. Tee ude pụrụiche na-achụ anwụnta, Bekee na-akpọ nke a ""mosquito repellent cream"" 7. I nwereike igba ọgwụ ikuku nke isi ya na-egbu anwụnta nke a na-akpọ ""insecticide"" na Bekee Ọrịa iba nwere ọgwụgwọ, a na-eji ọgwụ pụrụiche agwọ ya. Nwaada Akisanya si na ọ bụrụ na mmadụ bute ọrịa iba ọkachasi nke na-aba n'ụbụrụ, ọ bụ ihe mmadụ kwesiri ilebanyere anya ngwa ngwa dịka ndị Igbo si ekwu ""e mee ngwa ngwa emeghara ọdachi"". Ịmalite nataba ọgwụgwụ n'oge dị mkpa maka ị hapụ ọrịa a n'ime ahụ mmadụ ruo oge dị anya nwereike ime ka onye ahụ banye n'ọnọdụ nwereike memina ya maọbụ mebịe ime ahụ ya etu enweghizi ike igbapụta ya ọkachasi ụbụrụisi onye ahụ. Dịka Nwaada Akisanya si kwuo, echela ka ọrịa ruo ogogo nke ikpalite ọnọdọ mmadụ ịnọ n'etiti ọnwụ na ndụ, ọnọdụ a bụ nke Bekee na-akpọ 'Coma', akwụkwụ ịdọ mmadụ, maọbụ mmadụ ikọgheri akọgherị." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59752622 +politics Ipob: Ndị Ugwu agaghị enyelata Igbo ọkwa onyeisiala "Otu nwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra'(IPOB) akpọọla ndị okenye Igbo oku ka kwụsị ịrịọ ndị Ugwu ka ọkwa onyeisiala rute ha aka n'afọ 2023, ma sonye na mbọ nnwereonwe Biafra. Ọnụ na-ekwuru Ipob Bụ Emma Powerful kwuru nke a n'ozi mgbasaozi o binyere aka ma zitere BBC Igbo n'ụbọchị Wenezde. Otu Ipob gwara ndị okenye Igbo gụnyere Ohaneze Ndigbo na ndị Ugwu adịghị njikere inyefe onye Igbo ọchịchị n'ihi ihe ha kpọrọ 'obiinu' ha nwere n'ebe ndị Igbo nọ. Ha kwuru na kama ị na-arịọ ka enye ha ọkwa Onyeisiala, ha kwube okwu nnwereonwe. Ha gara n'ihu gbaa ama na ha agaghị anabata ka ndị okenye Igbo nwere Nnamdi Kanu zụọ okwe ịnweta ọkwa onyeisiala n'afọ 2023. Ozi ahụ sị, ""Ha kwesịrị ịmata na ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Ugwu nakwa ndị Fulani na-ekwu ihe na-eme na Naijiria agaghị ekwelata ka onye Igbo bụrụ onyeisiala Naijiria."" ""N'agbanyeghị ha na-aracha ha ike, ha nwere obi inu megide ndị Igbo. Ya bụ, ọ kama na ha tinyere uchu na inweta Biafra."" ""Ọ baghị uru ị na-ekwu maka ọkwa ọchịchị ịgbadata na 2023 ebe nwa afọ Igbọ bụ Nnamdi Kanu ka nọ na mkpọrọ."" Otu Ipob gara n'ihu dọọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ojiegoachụego, ndị ọdịnala, ndị ndu ụka na ndị ndụ Igbo gụnyere otu Ohaneze aka na ntị ka ha sepụ aka n'ikwu okwu ga-ebute ka e jiiri ndị Igbo akwa emo." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59670226 +health Female Genital Mutilation: 'A na-erosi m iro makana a chọrọ m ka a kwụsị ibi nwaanyị ugwu' "N'Ikwo dị na Ebonyi steeti, aha Mary Odumeke bụ ihe ọtụtụ ụmụnwaanyi ma. Ufọdụ bụ maka na ọ gbapụtara ha n'aka nne na nna ha chọrọ ka e bie ha ugwu. Ndị ọzọ bụ na ndị ọ lụụrụ ọgụ oge ọ chọpụtara na e biri ha ugwu. Na ihe nkiri a, Odoziakụ Odumeke kowaara BBC Igbo etu o si malite atumatu a, nakwa etu ụfọdụ mmadụ si na-ebuso ya agha maka ya. Ọ kọwakwara na ya agaghi akwụsị ịgba mbị ịhụ na ihe a ọ sị na ọ dịghị nwaanyị mma n'ahụ kwụsịrị kpam kpam. Gini mere Mary Odumeke ji buru ozi mkwụsi atụmatụ ibie ugwu n'isi? Ụbọchị isii n'ọmwa Febụwarị kwa afọ bụ ụbọchị otu jịkọrọ ọtụtụ mba ụwa bụ ""United Nations"" (UN) hibere maka icheta ma gbasaozi mkwụsị atụmatụ ọbụla gụnyere ibie ụmụnwaanyị ugwu. Gịnị bụ ibie ụmụnwaanyị ugwu? Ihe a bụ usoro ọbụla gụnyere mbepụ akụkọ ime ahụ utu nwaanyị maọbụ ire utu maọbụ merụ otu nwaanyị ahụ n'usoro na-abụghị usoro iwaahụ nke ndị ọrụ ahụike hibere. N'ọtụtụ oge ndị na-ibe ụmụnwaanyị ugwu na-abụ ndị na-ataghi ọzụzụ ịrụ ọrụ ịwa ahụ. Na mba ụwa a dụọla ndị dọkịnta ndụmọdụ n'itinye aka n'usoro ibie ugwu n'ihi na nnyocha gosiri na ụrụ adịghịrị ya nye ụmụnwaanyị. Ngalaba ahụike mba ụwa bụ ""World Health Organization"" (WHO) ekwuola na usoro a na-ebutere ụmụnwaanyị ọtụtụ nsogbu n'ahụike ha nakwa na ndụ ha. Mba dị ịcheịche gụnyere usoro a dịka ihe megidere ikike dịrị onye a ọkachasi n'ihi na ọ bụ mgbe nwaanyị dị na nwata ka a na-ebie ya ugwu nke bụ na a naghi enwe ike nata ikikere ya tupu eme ya maọbụ ọ gaghi etinye aka mee mkpebi na ọ chọrọ ya bụ usoro n'ahụ ya. N'akwụkwọ ozi otu ahụike bụ WHO ha dere na usoro a ""megidere ikike mmadụ inwere onwe ya pụọ n'aka mmekpa ahụ, usoro a bụ usoro ọjọọ; na ikike nke mmadụ ịdị ndụ"" Ha gara n'ihu dee ""usoro a na-etinye mmadụ n'ọnọdụ nwereike ibute ọnwụ."" Na nchịkọta ha kwuru na usoro na emegide ụmụnwaanyị ma na-ebute ịkpọ oke nye ha. E nwere ụdị na ụdị usoro a eji eme ibie ugwu nke gụnyere: Gịnị mere e ji ebie ụmụnwaanyị ugwu? E nwere uru dị na ibie ụmụwaanyị ugwu? Ngalaba ahụike mba ụwa bụ WHO kwuru họ ha na enweghi uru ọbụla dị na usoro nye nwaanyị ọbụla, ha kwuru na ọ bụ naanị ọghọm bụ ihe so ya. Ndị ọrụ ahụike gbara ama kwuo na usoro na ebute ọtụtụ nsogbu ahụike nke gụnyere ndị na-egosipụta onwe ha ngwangwa nakwa ndị na-adapụta n'oge dị tụ anya. Ụfọdụ n'ime ọghọm dị na-egosipụta onwe ha ngwa ngwa ma ebie nwaanyị ugwu bụ: Ụfọdụ n'ime ọghọm dị na-egosipụta onwe ha ngwa ngwa ma ebie nwaanyị ugwu bụ: Usoro a bụ omenala kachasịa na mba ndị Afrịka na mba ndị Asia nke bụ na ihe kariri ụmụnwaanyị nde nari abụọ bụ ndị emerela usoro a n'ahụ ha na mba ụwa ugbua. Nnyocha gosiri na kwa afọ a k na eme usoro a nye ihe ruru ụmụnwaanyị nde atọ. Ugbua ngalaba WHO na ejịkọla aka ọnụ agba mbọ ịhụ na ọtụtụ mba belatara usoro a, gbachapụrụ ya dị ka omenala na mba ha nakwa belatara mmụbawanye ya. Ndị mere akụkọ a bụ Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51400947 +business Emmanuel Chisom: 'Na nrọ ka m mụtara iji 'carton' arụ igwe na-enye ọkụ' "Ikokwu Emmanuel Chisom bu nwata akwụkwọ dị afọ 12 na-ewuzi ọfụma na soshal midia ka ọ rụchara igwe ọkụ na ntuoyi ji ""battery"" arụ ọrụ. Ọ bụ umụ he atufusiri atufu ka Emmanuel ji ruọ ihe ndi a ọ rụrụ. O nwetere ohere ịgụ akwụkwọ n'efu n'ụlọ akwụkwọ atọ maka ihe a ọ na-emepụta. N'ihe onyonyo a, Emmanuel kọwara na ọ bụ na nrọ ka a na-egosi akọ na uche etu o si arụpụta ihe ndị a. Onye mere akukọ a:Nnamdi Agbanelo" https://www.bbc.com/igbo/afirika-56467635 +health Breast pain: 'Ovulation', ara ibu ibu, inye nwa ara na ihe ndị ọzọ nwere ike ibute ara ịfụ nwaanyị ụfụ "Ọtụtụ ụmụnwaanyị nwere mgbe ara ha na-afụ ha ụfụ. Ihe na-akpata ya dị iche n'iche n'ebe ụmụnwaanyị nọ. Ụfọdụ ndị mmadụ na-eche na mgbe ọbụla ara na-afụ nwaanyị ụfụ, na ọ bụ maka ọrịa kansa maọbụ ọrịa ndị ọzọ. Mba! Ara ifụ nwaanyị ụfụ abụghị naanị mgbe o butere ọrịa. Dịka dọkịnta Udodi Okoli siri kọwa, ihe nwereike ime ka ara na-afụ nwaanyị ụfụ dị ọtụtụ. O nwereike bụrụ mgbaama ọrịa, maọbụ ihe ọzọ na-abụghị ọrịa dịka ara ibu oke ibu na nwaanyị eyighị akpa ara dị mma nke ndị Bekee na-akpọ bra. 2. Nwaagbọghọ Chimamanda Okafor sị na ara ya na-afụkarịrị ya ụfụ mgbe ọbụla ahụ ya nọ n'ihe ndị Bekee na-akpọ 'ovulation'. Ọ sị na ahụ ya ga na-eme ya ka ọ gakwuru nwoke ka ha nwe aramara. 3. Chioma Nkemdilim sị na tupu nsọ ya ebido, ara ya ga-afụrịrị ya ụfụ. Mgbe ahụ, ara ya abụọ ga-ebutu ibu, ma na-afụ ya ụfụ. 4. Chimezie Ucheagbo bụ nwaanyị na-enye nwa ara ugbua sị na mgbe mbụ ọ chọrọ inye nwa ya ara, na ara ya fụrụ ya ụfụ nke ukwu. Mana mgbe nwa ya na-amị ara ya, ụfụ ahụ belatara. O kwukwara na ọ bụrụ na nwa gị etinyeghị ọnụ ya nke ọma n'ọnụ ara gị, ọnụ ara gị nwereike fụọ gị ụfụ maọbụ gbawa. ""Mgbe nke a mere m, ọ fụrụ m ụfụ nke ukwuu. Agaghị m akọwalị ụfụ ya."" Ihe a ka nwaada Ucheagbo gwara BBC Igbo maka etu ụfụ ahụ dị. Chimezie kwuru sị, ""ọ bụrụ na ọnụ ara gị gbawa, ọ ga-aba ọnya nke na-eme ka ụfụ ya ka njọ. Nwaanyị ahụ nwereike ibute ọrịa site n'ọnya ahụ."" Ọ gwara BBC Igbo na ụdịrị ụfụ ọzọ ọ gabigara bụ mgbe nwa ya na-adịghị amịkọwa ara ya, nke a mere ara ya abụọ jiri gbajuo dọrọ, na-afụkwa ya ụfụ ma na-anyịkwa ya arụ. 5. Otu nwaanyị na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru sị na ara ya na-afụ ya ụfụ mgbe ọbụla ọ na-eme egwuregwu mmegharịahụ dịka igba ọsọ, iwuli elu, dgz. Ka o si kọwaa, ""m gbachaa ọsọ, ara m na-afụkarị m ụfụ makana o buru ibu."" Ọ gwara BBC Igbo na ọ na-eyizi uwe akpa ara dị mma iji belata ụfụ ya. 6. O nwere ụdịrị ụfụ ara na-egosi mgbaama ọrịa kansa. Juliet Uzoma, onye rịaburu ọrịa kansa ma gbakee, gwara BBC Igbo na ọ dị afọ 34 mgbe ọ chọpụtara na otu ara ya na-afụ ya ụfụ ma na-agbapụta ihe na-acha ụcha. O kwukwara na mgbe ahụ, okpuru mkpa abụ aka ya na-egbu ya mgbu. Ọ bụ mgbe ọ gara mee nnyocha ka ọ chọpụtara na ọ bụ kansa. Dọkịnta Okoli kọwara na ihe ndị ọzọ nwereike ịkpata ara ifụ nwaanyị ụfụ bụ abụ dị n'ara nke ndị Bekee na-akpọ abscess. Maọbụ ọnya mere na-ara nke butere nje ndị Beke na-akpọ 'mastitis'. Iji gbochie ara ifu nwaanyị ụfụ, dọkịnta Okoli kwuru na ọ dị mkpa ụmụnwaanyị ime ihe ndịa: A bịa n'ọrịa kansa, dọkịnta na-ahụ maka ahụ mmadụ gwara BBC Igbo na ọ dị mkpa ka ụmụnwaanyị na-abịa ụlọọgwụ maka nnyocha ahụ ha nke ndị Beke na-akpọ 'mammogram'. Tụmadị ndị rugoro afọ 40 na-agbago elu. Onye mere akụkọ a bụ Vining Ogu" https://www.bbc.com/igbo/afirika-59654997 +entertainment Anthonia Ogugua: Ọ dịghị mfe ịbụ nwaanyị na-agba mkpọnala Anthonia Ogugua bụ nwaanyị na-agba mkpọnala. Mkpọnala bụ egbe pụrụ iche nke na-egosipụta emume pụrụ iche n'ala Igbo. Ọtụtụ chebu na ọ bụ naanị ụmụ nwoke nwere ike ịgba ya bụ egbe. Mana Anthonia Ogugua egosila n'eziokwu na ihe nwoke na-eme, nwaanyị nwekwara ike ime ya karịa. Gere akụkọ ya n'uju n'elu. Ndị mere akụkọ a bụ Ikechukwu Kalu na Nnamdi Agbanelo. https://www.bbc.com/igbo/afirika-57097184 +entertainment Julius Agwu: Amataghị m nwunye m na ụmụ m ka m si 'coma' teta "Onye e ji emume ịkpa ụkaọchị mara bụ Julius Agwu bịara na ""Gịnị n'afịọ"" bụ emụme nkiri puruiche nke BBC Igbo na-eme na Fraịde ụbọchị iri abụọ na asaa na Septemba nke afọ 2019. Julius kwuru ọtụtụ okwu gbasara ahụike ya bụ nke ọ ka na agbake na ya. Ọ sị n'afọ 2016, ka ọ fọrọ abalị abụọ ka ya gaa ihe ngosi ịkpa ụkaọchị o nwere na London ka uche ya furu. Ebe ya nweteziri onwe ya bụ n'ụlọọgwụ bụ ebe ya nọrọ izuụka abụọ tupu ya amata onwe ya. Mgbe ọ tetere na ya bụ ụra ọnwụ, ọ mataghịzị nwunye ya bụ onye nọ n'akụkụ akwa ọrịa ya. Ọ sị na awara ya akpụ n'isi tupu ya bụ ọrịa abịa. Julius ka na-agbake na ya bụ ọrịa dịka ọ maliterela ọrụ ejije ya. Ọ kelere ndị niile kpeere ya ekpere mere o ji gbakee. Akụkọ ọzọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49855788 +health Ndị dọkịnta isi ekwuola na isimgbaka, abụghị mmụọ ọjọọ na-ebute ya Ndị dọkịnta na ndị ọkachara mara ọrịa metụtara ụbụrụ nke Federal Neuro-Psychiatric Hospital na Yaba, Legos akpọọla oku ka ndị ọrụ ntaakụkọ na ndị na-eme ihe onyonyo na-etinye uche n'ụdị ozi ha na ewpụta banyere ọrịa isi. Ha kwuru nke na ọgbakọ ha nwere n'ogige ha ụbọchị Tuzde. Dọkịnta Nworia Chukwudi kwuru na etu ndị ntakụkọ sị akọwa okwu ndị ọrịa isi na-eme ekwesịghị ekwesi n'ịhị na ọ na-eme ka a na asọ ndị ahụ asọ. N'otu aka ahụ, Dọkịnka Nwakire Chinwe kwuru na ọbụghị ezi okwu na-adịghị agwọ ara maọbụ ọrịa isi agwọ. Ha dọrọ ndị ihe nkiri Nollywood ọdụ ka ha na-eme nchọpụta tupu ha mee ihe nkiri Metụtara ndị na-arịa ọrịa ụburu iji gbanahụ iduhie ọha mmadụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-46817812 +politics Nnamdi Kanu: Ndị aka ha dị na nwuchigharị ya ka nkụ - Ifeanyi Ejiofor Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu onye ndu Ipob ekwuola na ndị ọchịchị aka ha dị na nwuchigharị ya na mba Kenya buru ibu. O kwuru nke a na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere tupu ha wuchie n'ụlọikpe n'ụbọchị 26 ọnwa Julaị, afọ 2021. Ejiofor sị na ihe ka mkpa ugbua bụ ịgbapụta Kanu n'aka ndị gọọmentị Naịjirịa tupu ha gbawa ndị so nwuchie ya n'anwụ. O kwukwara na a nwuchiri Kanu na mba Kenya bụ ebe e tiri ya ihe ụbọchị asatọ tupu a kpọbata ya na Naịjirịa. Kirie ihe o kwuru n'uju. https://www.bbc.com/igbo/afirika-57978014 +politics Benjamin Netanyahu ọ ga-achị Israel nke ugboro ise? "Akụkọ dị mkpa taa: N'ofesi, Ndị mba Izrel ekwuola na ha ga-eme ntuliaka n'ime ọnwa Epreelụ na-abịa, ebe Benjamin Netanyahu bụ onyeisiala ha na-ele anya ịbụ onyeisiala nke ugboro ise. Ọ bụrụ na Netanyahu merie ntuliaka a, ọ ga-abụ onyeisiala kacha chịa mba Izrel. Gịnị na-afịọ n'Anambara? Haruna Mohammed bụ ọnu na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara, gwara BBC na ọ bụghị eziokwu na ha adịghị aza oku ma a tọrọ mmadụ makana ọ bụ ọrụ ha ịhụ na obodo nwere nchekwa. Mohammed kwuru okwu a, ka ụfọdụ ụlọntaakụkọ dere na ndị mmadụ n'Umunze, sị na ntọrị na-eme na be ha adịghị enweta enyemaka, dịka o kwesịrị, n'aka ndị uweojii. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ọ bụghi eziokwu na anyị adịghị aza oku ndị Umunze - Uweojii Ngagharịiwe na Zamfara Ndị mmadụ bara okporoụzọ taa n'obodo Tsafe dị na Zamfara steeti igosi iwe ha maka ogbugbu mmadụ na mwakpo ndị ọzọ na-eme na steeti ahụ. Ihe nkiri ndị mmadụ tinyere na Facebook gosiri ọtụtụ mmadụ ji osisi na mma na-aghagharị ma na-ekwu ""anyị achọghị"". Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ọgbaghara adaala na Zamfara N'egwuregwu, Kedụ ndị na-akwado Arsenal ebe a? Onye egwu bụ Henrikh Mkhitaryan, apụọla n'egwu site n'ụkwụ ọ gbajiri. Ndị Arsenal kwuru na ọ gaghị agba bọolụ n'ime izu isii, ruo mgbe ọ ga-agbake. ""Depụta ihe niile ị mere mgbe ị bụ gọvanọ"" Onye kwuru nke a. Ọ bụ ihe ọnụ na-ekwuchitere Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo sara onyeisi otu APC bụ Adams Oshiomhole dịka ha na-ama aka. Cheta na Oshiomhole katọrọ Rochas Okorocha na mmalite ịchụnta vootu Hope Uzodinma n'Owere. Ọzọ, Ụmụ mmadụ ataala onyeisiala Buhari ụta, ụfọdụ kpọrọ oku ka akwụsị abụbọọrụ ahụ ebe ndị ọzọ ekwuola na ha ga achọ ọrụ ọzọ dịka otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum akpọrọ ASUU n'aha ịchafụ kwudosi ike na abụbọọrụ ha ga-aga n'ihu. Na mba ofesi, Dịka ala ọmajiji mechara na mba Indonesia, ndịọrụ gbatagbata adọọla ndị biketere mmiri nso ha kwapu n'akụkụ mmiri n'ihi na ibibia mmiri nwereike ịme ọzọ. Cheta na mmadụ karịrị narị abụọ anwụọla mbụ n'ihe mberede a. N'egwurewgu, Thiago Silva abanyela n'ọnụọgụgụ ndị ọgba bọọlụ otu PSG ndị ohi gbakara ụzọ ya mgbe ọ nọ n'ọgbọ egwuregwu. Ndị uweojii kwuru na ọnụ ihe ezuru na bee ya ruru puku euros ole na ole. Gee Nkeji nke ụtụtụ" https://www.bbc.com/igbo/afirika-46670791 +politics Elisabeth Ndubuisi Chukwu: Gọọmenti etiti gwa anyị ihe gburu nwanne anyị Ndị be Elizabeth Ndubuisi Chukwu nwụrụ n'ụlọ oriri na nkwari na mba Sawụt Afrịka arịọla gọọmenti etiti Naịjirịa ka ha gba mbọ chọpụta etu nwanne ha nwaanyị si nwụfuo na mba ahụ. Chiedu Ndubuisi bụ nwanne ya nwoke gwara BBC Igbo na onye nnọchiteanya obodo Naịjirịa na Sawụt Afirịka gwara ya na nyocha ozu ndị dịbia bekee mere na-egosi na-atọgburu nwanne ha nwaanyị. Ndubuisi kwuru na ọ bụ ada ya nwaanyị nọ na Sawụt Afịrịka agụ akwụkwọ ka nwanne ya hụrụ anya ikpeazụ tupu ọnwọ makana ọ gara n'ụbọchị fotere ubọchị ọ nwụrụ ga leta ya. O kwuru na ruo ugbua, ahụ ọ majiji ka na-ama ada ya ahụ. Ndubuisi kwuru na nwanne ha nwaanyị nuru di mana ya na dị ya ebighịzi tupu ọ laa mmụọ. Ọ mụtara otu nwa. O kwuru na ka ọ dị ugbua, onye nnọchiteanya Naịjirịa na Sawụt Afrika na-ekwu na ndị uweojii na mba ahụ apụtabeghị bia were ihe nkiri 'CCTV' gosiri etu ọnwụ nwanne ya si mee. Ndubuisi kwuru na Elizabeth Chukwu bụ otu nwanne ya bụ ọpụrụiche maka etu o si emete ihe ọfụma. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48918946 +politics Arthur Nzeribe Buried: Etu mmemme akwamozu ya siri gaa "Ọtụtụ ndị ọdịka mmadụ ọdịka mmadụ n'Imo steeti nakwa ala Igbo niile gbakọrọ n'obodo Oguta taa bụ Satọde, abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Mee afọ 2022, ịkwanyere Arthur Nzeribe ugwu ikpeazụ. Arthur Nzeribe bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama n'imo Steeti, onye rụkwara ọrụ dịka Sịnetọ nọchitere anya mpaghara Imo West n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa. Ọtụtụ ndị gara n'emume akwamozu a gụnyere Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodinma, na aka chịburu Imo steeti bụ Emeka Ihedioha. Ndị ọzọ gụnyere Emmanuel Iwuanyanwu, Enyinnaya Abaribe, Gerald Ironah, ndị omeiwu a ma ama, na ọtụtụ ndị ọzọ. N'okwu ya n'emume akwamozu ahụ, Gọvanọ Uzọdịmma kọwara Arthur Nzeribe dịka isi a hụrụ kwaba okpu na ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo steeti. ""Okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa agaghị ezu oke ma ọ bụrụ na-akpọnyeghị aha Arthur Nzeribe,"" Uzodinma kwuru. ""Ọ bụ nnukwu mmadụ, nwa nwoke Imo steeti ji eme ọnụ."" N'omenala Igbo, ọ naghị adị mma ikwu okwu ọjọọ banyere onye nwụrụ anwụ, nke a mere na oge ọbụla mmadụ lara mmụọ, naanị okwu ọma ka ị ga na-anụ banyere ya. Akụkọ banyere ọnwụ Arthur Nzeribe ebulitela ọtụtụ okwu banyere nnukwu mmadụ a kpara ike na ndọrọndọrọ ọchịchị Imo steeti na Naịjirịa. Ọtụtụ na-ekwu okwu ọma banyere ya, ebe ndị ọzọ na-akatọ ụfọdụ ihe o mere oge ike ka dị ya. Mana ọ bụ gịnị ka ọtụtụ mmadụ ji kpụrụ Arthur Nzeribe n'ọnụ? Ụbụrụ ya na-aghọ nkọ N'ezie, abịa n'ịma akwụkwọ, ụbụrụ Artur Nzeribe na-acha ọkụ. O nwetara agụmakwụkwọ n'efu na mba Ingland n'afọ 1957. Oge ọ lọtara Afrịka, ya na Kwam Nkrumah, bụ onyeisiala mbụ nke mba Ghana rụkọrọ ọrụ. Nzeribe dekwara ọtụtụ akwụkwọ banyere ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa. Ndị ọ kpọlitere na ndọrọndọrọ ọchịchị Mmadụ dịka Emeka Ihedioha agaraghị abụ aha a na-anụ anụ taa ma e wepu ndị dịka Arthur Nzeribe. Ọ bụ site na nkwado Arthur Nzeribe ka Ihedioha ji banye n'ụlọ omeiwu nta Naịjirịa ebe ọkwa ya nọ gbalite ruo osote onyeisi. Cheta na Emeka Ihedioha mechara bụrụ gọvanọ Imo steeti, mana ụlọikpe kachasị mechara chụtuo ya. Ndị ọzọ Arthur Nzeribe nyeere aka na ndọrọndọrọ ọchịchị gụnyere John Oyegun, Gerald Irona, Gideon Nwaeze, na ndị ọzọ Ụlọọrụ FANZo hibere Arthur Nzeribe malitere ụlọọrụ ya nke ọ kpọrọ FANZ n'afọ 1969. N'oge ahụ ụlọọrụ ahụ so n'ụlọọrụ Naịjirịa a kacha anụ aha ya na Naịjirịa. June 12, 1993 Arthur Nzeribe so n'isi sekpụ ntị mere e ji kagbuo mpụtara ntuliaka e mere na Naịjirịa n'afọ 1993. Ọ bụ Nzeribe bụ onyeisi otu kpọrọ onwe ha 'Association for Better Nigeria (ABN)' nke gara nata akwụkwọ ikike n'ụlọikpe iji gbochie ntuliaka ahụ. Ọ bụ n'akwụkwọ ikike a ka onyeisiala oge ahụ bụ Ibrahim Babangida gbakwasara ụkwụ iji kagbuo ntuliaka Jun 12. Ebubo ịzụ ahịa ngwa ọgụ Ụfọdụ akụkọ kwukwara na Arthur Nzeribe zụrụ ahịa egbe. Ebubo a na-ekwu na Nzeribe resịrị Naịjirịa nakwa Bịafra egbe n'oge agha, mana amaghị kpọmkwem ma nke a ọ bụ eziokwu. Ebubo izu ego Na Nọvemba afọ 2002, ụlọ omeiwu ukwu nke Anyim Pius Anyim nọ n'isi ya, boro Nzeribe ebubo na o riri ego dị nde naịra iri abụọ na abụọ (N22 million). Ebubo a mere e ji chụpụ Nzeribe n'ụlọ omeiwu ukwu. Nzeribe akwadoghị 'Orlu State' Dịka okwu nkewapụta steeti ọhụrụ na Naịjirịa na-aga n'ihu, Arthur Nzeribe so na ndị na-akwadoghị ka e kewapụta Steeti Orlu. O mere nke a n'agbanyeghị na ọ bụ ya na-anọchite mpaghara Orlu n'ụlọ omeiwu ukwu. Nke a mere Arthur Nzeribe na Gọvanọ Imo steeti n'oge ahu bụ Achike Udenwa see nnukwu okwu. Udenwa haziri ngagharịiwe nke ọ kpọrọ ""One million march"" iji kpọọ oku ka a chụtuo Nzeribe n'ọkwa. Francis Arthur Nzeribe alaala mmụọ. Otu onye ezinụlọ ya kwuru na nke a mere eme n'ezie. Dịka o si kwuo, Arthur Nzeribe nwụrụ n'ụlọọgwụ dị n'ala bekee. Ezinụlọ Nzeribe mechara wepụta akwụkwọ ozi nke ha ji kwuo kpọmkwem na nna ha ukwu alaala mmụọ n'eziokwu. Ha dere sị: ""Ezinụlọ obi eze Nzeribe nke dị n'obodo Umudei, Oguta...na-ekwupụta ọnwụ nwa anyị, nwanne anyị, nna anyị na papa nnukwu anyị bụ Ichie Francis Arthur Uzoma Nzeribe."" ""Ọ lara mmụọ n'abalị ise nke ọnwa Mee afọ 2022, ka ọ gbachara afọ iri asatọ na atọ (83). ""Ezinụlọ anyị ga-amalite emume na ihe ndị ọzọ dịka omenala anyị si dị, tupu anyị ekwupụta etu mmemme akwamozu ya ga-esi gaa."" Ndị binyere aka n'akwụkwọ ozi ahụ bụ Francis Anyaegbu Nzeribe, Anthony Akpati Nzeribe na Oliver Nwedo Nzeribe." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61357130 +business Workers' Day: Lee nsogbu ise coronavirus buteere ndịọrụ "Abali mbụ nke ọnwa Mee afọ ọbụla bụ ụbochị ndịọrụ ji agbakọ emerube ụbọchị, mee 'parade', ma tụọ alo etu ha si akwado akụnaụba na mwulite obodo, mana n'afo a, egwu adaghariri n'ihi oria coronavirus. Dika onyeisioche otu NLC ngalaba nke Enugwu steeti bụ Comrade Virginus Nwobodo si gwaa BBC Igbo, onye ọbụla nọ be ya n'ihi ụjọ coronavurus."" Kemgbe ọrịa coronavirus malitere kpaba ike na Naijiria bido na ngwụcha onwa Februwari afọ 2020, oge onye mbụ bubatara ya,ọnọdụ ndị ọrụ na Naijiria dịzi ka nke nwaanyi ime na-eme; etu ọbụla o si tụgharịa,nsogbu. Nsogbu ndi a metutara ahụike, ọnọdụ ọrụ,mmefu ego ntụmadi, na ọdịda akụnauba ezinaụlọ. Nwobodo, onye kwuru na ""ụjọ coronavirus bụ ahụoku nke onwe ya"" si na coronavirus mere ka ha na-emefu oke ego ịga ọrụ nakwa ịzụ nri, ọgwụ na ihe ndị ọzọ dị mkpa maka ezinaụlọ nke na "" ego ndịọrụ anaghị ezuziri ha n'ọnwa."" Ọ bụghi naanị ihe ndị a ọ rụtụrụ aka, lee ụfọdụ ajọ ọnọdụ Coronavirus tinyerela ọtụtụ ndịọrụ: 1. Ezumike akwụụgwọ Mmachi ngaghari kpochiri ụzọ ọtụtụ ụlọọrụ dị na Naijira si achụta ego dịka ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ụlọ. N'ọnwa Eprel, ụlọọrụ ụgbọelu Arik kwuru na malite n' abali mbu nke onwa Mee afọ 2020, na ọtụtụ ndịọrụ ha,(pasent 90), ga-anọrọ ezumike akwụ ụgwọ rue mgbe a mabeghị n'ihi na ego anaghịzị abata dịka e nweghịkwa ndị na-eme njem ụgbọelu ugbua. 2. Mgbubi ụgwọọnwa Kedụ nke I ga-ahara n'ime zuo ike n'ụlọ na anaghị ụgwọọnwa na rụọ mana anyi ga-egbubi ụgwọọnwa gi? Goomenti Kaduna nyere iwu ka ewepu pasent iri abụọ na ise(25%) na ego ndi welitere isi n'ọrụ oyibo steeti ahụ iji kwado mbọ a na-agba ịhụ na agụụ egbughị ndị ogbenye n steeti ahụ dịka a machiri ngaghari maka coronavirus. Mana ya bụ atụmatụ atọghị ndị ọrụ steeti ahu ọchị ma ọlị. Otu onyeisioche otu jikoro ndị ọrụ bụ NLC na steeti ahu bu Ayuba Suleiman kwuru na ọ bụghị na mmanye ka a ga-asi ndịọrụ tinye ego were kwado ọgụ megide coronavirus. "" O kwesịrị ịbụ o metụta gị n'obi ịtụnye nke gị."" Ọ bụghị naanị Kaduna steeti mere nke a, Arik gbubiri ụgwọọnwa ndịọrụ ha n'ọnwa Eprel tupu a gwa ha nọrọ n'ụlọ. 3. Ichụ n' ọrụ Ndị Igbo sị na ọ naghị ahịa ahụ, ọ hịawa ahụ. Ka ọchị, ka egwu, ụfọdụ ndịọrụ ga-esi na ịnọ n'ụlọ ghọọ ndị enweghị ọrụ. Otu jikoro ndịọrụ njem ụgbọelu bụ ' International Air Transport Association'(IATA) na Bekee gbara ama na ọrụ dị 91,380 ga-ala mgbuka na Naijiria dịka ọnụgụgụ ndị njem ụgboelu ji nde ato na uma ise(3.5m) gbatuo n'oge corona virus a. O bughi naani ugboelu, otutu ulooru akpuola afo n'ala nke na ha agaghi enwe ike kulie ozo ma coronavirus laa. Onye makwanu mgbe o ga-ebi? 4. Ọrụ ezu ike Ajị ekweghị ka a mara na ọsịsa na-agba nwa mkpi. Na ọtụtụ ndịọrụ nọ n'ụlọ ezu ike maọbụ si n'ụlọ na-arụ kemgbe mmachi ngagharị ekweghị ka a mara na o nwere ndi ekutebeghị ume kemgbe coronavirus batara Naijiria. N'ozi o ji kelee ndịọrụ, ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee afọ a, Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Dọkita Osagie Ehanire sị, ""Ana m kelere ndịọrụ ahụike dịka ndị dọkịta,nọọsụ, ndịọrụ 'lab', na ndị niile na-arụ ọrụ kwa ụbọchị kemgbe coronavirus bidoro."" Mana ọ bụghị naanị ndịọrụ ahụike bụ ndị aṅụbeghị mmiri tọgbọ iko n'oge a. Ndị uweojii, ndị ntaakụkọ, ọbụladị otu 'Presidential Task Force on Covid -19' na-arụ ọrụ kwa ụbọchị, na ezughị ike kemgbe coronavirus malitere. 5. Ọnwụ akwadoghị akwado Kemgbe coronavirus bidoro ndịọrụ ụfọdụ nọ n'ihu agha megide ọrịa ọjọọ a ebutela ọrịa n'ihu ọrụ, ebe ụfọdụ tụnyerela ndu ha. Dika ozi si na NCDC puta si kwuputa na ụbọchị iri atọ nke ọnwa Eprel, ndịọrụ ahụike gunyere ndị dọkịta, nọọsụ na ndịọrụ ahụike ndị ọzọ dị 113 ebutela ọrịa coronavirus, ebe ihe ruru anọ nwụrụ anwụ. Ka o si kwuru taa bu 1/5/2020, na Naijiria,mmadu 1,728.ebutela coronavirus,ebe mmadu 51 nwụrụla site na ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52510765 +entertainment Genevieve Nnaji: Ugboro isii nwaada Igbo a gosiri na agbara bụ nwanne mmadụ "Genevieve Nnaji bụ nwaada Igbo a ma ama n'ime ejije nke aha ya na-akpọtụ na Naijiria na mba ndị ọzọ n'ihi nka ya. O sonyela n'ihe nkiri karịrị iri asaa, ma nwetakwa ọtụtụ nturuugo na Naijiria nakwa n'Afrịka n'ihe gbasara ime ejije. Ọtụtụ ndị mmadụ na-anụ aha ya mana ha amaghị nke ọma, ya mere akụkọ a ga-eji emepe gị anya banyere nwada a. Ihe i kwesịrị ịma maka Genevieve Nnaji Ihe ada Mbaise a na-eme na-atụ ndị mmadụ n'anya nke na ọtụtụ na-ahụ ya dịka ụgbala enweghị oyiri. Mana agbara a abụghị kwanụ mmụọ; lee ihe ụfọdụ o merela mere e ji ahụ ya ka 'nwa mama' Ụfọdụ na-efezi ya ka chi kpọrọ ya ""Beyonce nke Afrika"". Ebe ụfọdụ ji ụmụnwaanyị kara aka dịka Agbani Darego, Omotola Jalade Ekeinde, Nse Ikpe Etim atụnyere ya. Mana ndị ọzọ si na o nwere ihe dị iche n'etiti akara edemede 'B' na ụkwụ ehi. E mechara họrọ ya bụ ejije ka ọ nọchite anya ejije ndị Naịjirịa na emume nturuugo 'Oscar' nke afọ 2019, mana ọ garughi n'isi mmiri. Ya bụ ihe mere ka iwe too ọtụtụ ụmụ Naijiria afọ dịka ha kwuru na nzere ahụ tọsịrị Genevieve na ihe nkiri 'Lion Heart.' Oprah kwuru na Genevieve bụ ""Julia Roberts nke Afrịka."" Mana n'afọ ole na ole gara aga, nwaada Genevieve laghachịrị n'isi ya etu chi ndị isi ojii siri kee ya. Nzọụkwụ a mere ka ọtụtụ jaa ya mma maka ịkwado ihe ndị isi ojii. Aha ya dịkwa n'aha ndị e ji ihu ha ere ahịa dịka ọ kpọtụrụ akpọtụ mgbe o mere 'face of Lux.' Na nso nso a, akpụnwa a tiri akwa e ji egwu mmiri maọbụ nọrọ ezumike n'ikperemmiri see foto gosiri ya dịka 'tomato Jos' n'agbanyeghị na o teela Awụsa na ụta. Ejiji o yi na foto ahụ mụnyere ọkụ n'ịntanetị. Mana ihe Genevieve jiri dị iche na ndị nọrọla be nna ha mụọ nwa bụ na ọ chịkọtara onwe ya chụwa akara aka ya na-eleghị anya n'azụ. Nke a mere na ọtụtụ anaghị echetazi na o nwere mgbe 'leather' bụ kanda nkịtị. Ndụ nwata a nke nne ya bụbu onye nkuzi ọtakara na-akasi ọtụtụ enweghị olileanya obi, n'ihi na ọ bụ onye nwere etu o si ebu onwe ya nke mere ka a na-ahụ ya dịka onye ngala kwesịrị. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-52158518 +sports Afcon 2021 Final Update: Etinyela ụbọchị ezumike na mba Senegal iji ṅụrịa maka mmeri ha "Onyeisiala mba Senegal bụ Mack Sall ekwupụtala taa bụ Mọnde, abalị asaa nke ọnwa Febrụwarị 2022, dịka ụbọchị ezumike. Nke a bụ ka ndị mmadụ wee ṅụrịa maka nturugo Senegal nwetara n'asọmpi iko mba Afrịka a kpọrọ 'African Cup of Nations' 2021. Macky Sall nọ mba ofesi n'abalị Sọnde oge a gbara asọmpi a, mana ọ kagburu njem ya lọta iji soro ndị mba ya ṅụrịa. Onyeisiala Sall ga-ezute ma kelee ndị ọgbaa bọọlụ mba ahụ n'ụbọchị Tuzde n'obi gọọmentị dị na Dakar. Nke a bụ nke mbụ mba Senegal na-emeri asọmpi Afcon, dịka e meriri ha n'agba nke ikpeazụ ya bụ asọmpi n'afọ 2002 nakwa 2019. Penariti ise a satara abụọ ka Senegal ji merie ndị Egypt n'ụbọchị Sọnde, abalị isii nke ọnwa Febrụwarị 2022. Cheta na asọmpi nke a bụ nke e kwesịrị ịgba n'afọ 2021, mana e bugharịrị ya n'ihi mfesa ọrịa coronavirus. Aṅụrị na-egbu ndị mba Senegal ka mmanya ugbua dịka ndị bọọlụ ha mabutere iko Afcon. N'ime nkeji 90 a gbara asọmpi ahụ, nakwa nkeji 30 a gbakwụnyeere ha, onweghị onye nyetere ibe ya goolu. Nke a mere ya bụ asọmpi jiri bie na penariti. ""Nke a gosiri na onye ọbụla gbasiri mbọ ike, kwụdosie ike, ọ ga-enweta ihe ọ na-achọ,"" Aliou Cisse, onye nkuzi ndị Senegal kwuru. ""Ọ dị m ka m bewe akwa n'ihi na anyị bụ ndị Senegal achọọla iko a ihe ruru afọ 60."" N'aka nke ọzọ, anya mmiri ka Mohammed Sala ndị otu ya ndị Egypt ji nara ọlaọcha ha ritere n'asọmpi Afcon 2021. Cheta na Sala na Sadio Mane nke Senegal na-agbara otu egwu bọọlụ Liverpool na mba England. Ha abụọ so na ndị e ji eme ọnụ n'otu bọọlụ ahụ, mana Mane bụ onye nyere penariti ikpeazụ Senegal ji nweta mmeri. Gọọmentị mba Germany ekwuola na o cheghị na ha ga-ahapụ ndị agha ha nọ na mba Mali ugbua iji nyere ha aka buso ndị oyi ndụ egwu agha. Mịnịsta nchekwa mba Germany bụ Christine Lambercht kwuru na ihe kpatara nke a bụ maka nghọtahie dị n'etiti ndị agha Mali na ụfọdụ Mba ndị ofesi nọ na mba ahụ dịka Fransị, Germany, na ndị ọzọ. Ọ sị na ọ na-adị ha ka ndị agha Mali achọghizi ndị agha Germany na mba ha. Ndị agha Germany nọ na Mali maka nchekwa na ime udo dị ihe dịka 1,200 n'ọnụọgụgụ Cheta na ndị agha Mali chụturu ndị nkịtị ma weghara ọchịchị n'ọnwa Mee afọ 2021. Ndị agha ahụ kwuburu na ha ga-ahazi ntuliaka ma nyefekwaa ndị nkịtị ọchịchị. Mana ha mechara kagbuo nkwado ntuliaka ahụ ma kwuo na ha ga-anọ n'ọchịchị ọtụtụ afọ. Ndị agha ahụ kwukwara na ha ga-agbaso ụfọdụ ndị agha ọrụ ngo si mba Russia, a kpọrọ 'Wagner group', ka ha nyere ha aka n'agha megide ndị na-eyi ndụ egwu. N'ọnwa Disemba afọ 2022, mba 16 - ọtụtụ n'ime ha bụ ndị Europe - katọrọ ndị agha Mali maka atụmatụ ahụ ha na-agbaso. Ndị ọkachamara na-ekwu na nke a nwere ike ịgbanwe agha a na-ebuso ndị oyi ndụ egwu na mpaghara Sahel nke Afrịka. Onyeisioche obodo Ottawa dị na mba Canada etinyela ọnọdụ gbatagbata iji kee nkwụcha maka ihe ntụmadị nwereike ịdapụta maka abụbụọrụ ndị ọkwọ ụgbọala ogologo Bekee kpọrọ ""truck"" gbata na mba ahụ maka iwu covid-19 a tụkwasara ha n'isi. Jim Watson sị na oke ọgbaghara nwereike ịdapụta ebe ahụ maka na ndị ọkwọụgbọla ahụ akarịala ndị uweojii pụtara ọrọ n'ọnụọgụgụ. Ndị ọkwọụgbọala ogologo a ji ụgbọala ha mechie ụzọ niile nke bụ na ọnweghị ndị na-agafeli. Ha malitere ngagharịwe a ha kpọrọ ""Freedom Convoy"" maka iwu gọọmentị na ha ga-agbariri ọgwụ mgbochi covid-19 bụ nke ha jụrụ ajụ na ọnweghị onye pụrụ ịmanye ha ịme nke a. Dịka Mazi Watson kwuru na radio CFRA, ọ sị na ndị ọkwọụgbọla ogogologo ahụ na-emezị ka ndị nkopu site ""n'igbu opi akwụsị akwụsị, werezie ya bụ ọnọdụ gbarazịa oringo"". Maazị a sị na, ""nke bụ eziokwu bụ na a na-emeri anyị n'agha a"". "" anyị ga-esepụ ya bụ aka enwe n'ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ. O ruola mgbe anyị ga-azọpụta obodo anyi"". Onyeisioche a ekwughị ihe onwereike ime iji belata ọnọdụ a mana ndị uweojii kwuru ụbọchị ụka na ha ga-enweligwu aka n'ọnọdụ nchekwa ma malite ịkpachị ndị niile na-akwado ndị ngagharịiwe a. Ọnọdụ gbatagbata a ga-enye ndị ọrụ ikike ịnwetakwụ akụrụngwa ga-enyere ha aka ịpịnyụ ya bụ ọgbaghara ka ọkụ. Ndị ọrụ steeti ahụ sị na ya bụ ọnọdụ gbatagbata gosiri na ya bụ ""egwu apụọla na joromi"" ""ọkachasị n'itinye ndị ebe ahụ n'ọnọdọ itụ egwu mana na-agosikwa na oruola mgbe ha ga- etigara ndị steeti ọzọ mkpu enyemaka"". Ọtụtụ ndị ebe ahụ ajụla ya bụ ngagharịiwe maka ajọ agwa ndị ahụ na-akpa nke gụnyere igbochi ndị mmadụ ụzọ, ịrụ ụlọ alawaghara n'ụzọ, ekwu ịwakpo ndị mmadụ nakwa oke ego ndị ebe ahụ na-etufu maka ya bụ ọnọdụ. Ndị uweojii sị na nke na-echu ha ụra ugbua bụ ka ya bụ ngagharịiwe siri rata ndị nkatọ ọkachachị ndị ekweghị na gọọmentị nọ n'ọchịchị. Ha sị na ha enwetaka mkpesa ruru iri isi (60) nke gụnyere aka ntụtụ, ịkpa arụ, akpọasị na imebi ihe ndị mmadụ site na ya bụ ngagharịiwe. A nwuchiela ọtụrụ mmadụ ma kpachikwaa ụfọdụ ụgbọala maka nke a. Otu onye ọkwọ ụgbọala ogonogo bụ Kimberly Ball si ebe tere aka bịa isonye ya bụ ngagharịiwe gwara AFP na ""ngagharịiwe a bụ maka ""mnwere onwe anyị"". Agbanyeghị na ndị Canada na ndị omeiweu ha na-ekwu na ọbụghị taa ka ụdị ngagharịwe a bịawara ebe ha mana ndị uweojii na-ekwu na ha ahụbeghị ụdị a mbụ ọkachasị otu ha si nweta ndị nkwado na-ewepụta ego ha ji eme ya bụ ihe. GoFundMe kwuru na Frịade na ya ga-akpachi nde kwuru nde dọla ndị mmadụ tụtara maka ngagharịiwe maka ọgbagharị ndị uweojii sị na na-eme. Ọ dịghị mgbagha na ndị ngagharịiwe akpọọla ekwo nkụ na ha agaghị akwụsị akwụsị nke bụ na ọtụtụ na-esonyezi ha kemgbe izuụka abụọ gara aga. Dịka amabeghị mgbe ihe a ga-ebi, ọ na-agbagwoju ndị obodo ahụ anya ihe mere ndị uweojii jiri hapụ ya bụ ngagharịiwe ka o ruo otu a. Akpụpụla ndị na-eme ngagharịiwe ụlọikpe maka oke oti ha ji egbuchi ndị mmadụ ntị agbanyeghị na ndị isi ha ekwuola na ha na ebelata ụzụ opi, ọkachasị n'abali. Itinye ọnọdụ gbata gbata bụ ihe ikpeazụ ndị isiọrụ steeti ahụ ga-eme agbanyeghị na ọnweghị onye ma mgbe ya bụ ihe ga-ebe. Ndị isi ngagharịiwe Freedom Convoy kwere nkwa na ha agaghị akpa aghara, na ha ga-eruwe isi n'iwu mana na ha ga-anọ ruo mgbe ọbụla. Ngagharịiwe malitere ọnwa gara aga mgbe gọọmentị Canada tiri iwu na onye ọbụla na-anya ụgbụọla ogonogo a ga-agbariri ọkwụ mgbochi tupu ha esi US banye Canada." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60257009 +politics Mbazulike Amechi: Ọ bụrụ na ndị ọbụla eketeghi oke ha na Naịjirịa ọ ga-ekewa Mbazulike Amechi bụ otu onye so gbaa mbọ maka nnwereonwe Naịjirịa ebe afọ 1960 etinyela ọnụ n'ihe gbasara ọchịchọ Biafra. O kwuru sị na otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ ndị na-achọ nnwereonwe Biafra selitere isi ugbua n'ihi iwe maka etu ha si hụ obodo Naịjirịa. Ma kwuo na ebe ihe masịrị ha bụ ka ha nọrọ ma chịa onwe ha, na ọ ga-adị mma ka a tụọ vootu mara ma ha a ga-apụ na Naịjirịa maọbụ ha a ga-anọ. Amechi kwuru sị na agaghịzị eji ọgụ na mma lụọ agha Biafra, kama na ọ bụzị akọnauche ka a ga-ejizi alụ ya. Ọ gara n'ihu kwuo sị na ọ bụrụ na agaghị eme ndị Igbo ka e mere ibe ha na Naịjiria, na ọ ga-aka mma ka a hapụ ndị Igbo ka ha gawara onwe ha, n'agbanyeghi na ọ gaghị amasị ya ka Naịjiria kewaa. Ndị mere akụkọ a bụ Ebere Ekeopara na Nnamdi Agbanelo https://www.bbc.com/igbo/afirika-54170218 +politics Buhari Resign: 'Anyị agaghị asa Garba Shehu, okwu a karịrị ya' - Ọnụ na-ekwuru Abaribe "Ọnụ na-ekwuchitere Enyinnaya Abaribe bụ Uche Awom azaghachila okwu Garba Shehu kwuru maka ọkwa Abaribe mara ka Onyeisiala gbaa arụkwaghịm. Maazị Abaribe sị na ihe butere ya bụ ọkwa bụ maka etu nchekwa obodo Naijirịa siri kụọ afọ n'ala. Kama, onyeisiala Buhari sitere n'ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Shehu zahachi ya, were sị - na ụfodụ ndị na-ekwu ka Buhari pụọ n'ọchịchị abụghị na ọ bụ uche ndị Naijirịa niile. Gụọ ihe o kwuru n'ụjụ ebe a. N'ịza ihe o kwuru, Awom sị ""agaghị ewetu okwu a ala maka na o rughi Garba Shehu ọnụ"". Ọ kọwakwara na ọ bụ ihe Sinetọ Abaribe kwesịrị ime ka o mere dịka onyeisi ndị omeiwu na-anọghị n'ọchịchị. Ọ sị ""ọrụ ya dịka onyeisi ndị anọghị n'ọchịchị bụ igosi gọọmenti ebe ha riri mperi."" O kwuru na ihe kacha dị Abaribe mkpa bụ nchekwa ndụ na akụnaụba ndị Naijirịa niile. Awom sị na okwu Nnamdi Kanu bụ ihe dị n'ụlọikpe, ""Shehu ekwesịghị itinye ọnụ n'okwu dị n'ụlọikpe"". Dịka ụlọikpe kwuputara atụmatụ maka ụgwọ mgbapụta Kanu, Awom kwuru na Abaribe mere ihe o kwesiri ime dịka onye Igbo. O kwukwara sị na ha agaghị ekwu maka okwu Kanu n'ihu Shehu maka na Shehu abụghị ụlọikpe. Ọ bụghị taa ka Abaribe bidoro ikwu maka ihe ndị Naịjirịa na-agabiga, ọkachasị ebe o metụtara nchekwa, dịka na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ihe a: Ọtụtụ ndị mmadụ kwuputara obi ha maka ọkwa a mara ka onyeisiala gbaa arụkwaghịm, lee uche ha: Tosin Olugbenga chetara ihe gọọmentị Buhari kwuru mgbe ha banyere n'ọchịchị. Leesi Barivole sị ""Dịka anyị kwadoro #justiceForChima, ka anyị kwadokwa #BuhariResign"". Adeparusi Adebayo sị ""ọzọ e bo Abaribe ebubo nrụrụaka"". Baba Alhaji sị na Abaribe kwesịrị ịnọ na nga." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51306628 +politics David Umahi: Ihe ndị Ebonyi na-ekwu maka etu o si gbalaga hapu Ebonyi "Okwu na David Umahi buzi onye otu pati ""All Progressives Congress"" (APC) bụzị akụkọ a kọrọ gafee. Mana ụfọdụ ndị Ebonyi tinyere ọnụ na ya bụ okwu ma kwuo etu o si emetụta ha n'obi. Ebe ụfọdụ sị na gọvanọ Umahi emeteghị ya dịka ha na-ahụ Ebonyi dịka steeti PDP, ndi ọzọ na-asi na ha nabatara ya dịka ihe ga-ebutere ha ọganirụ. Gee ha ntị n'olu:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-55012482 +business Imsu Babe: Ihe m na-ede n'efere abacha m mere ndị mmadụ ji abụ ya ụbụ Nwada Blessing Ogbonna na-agwọ ma na-ere abacha kọwaara BBC Igbo etu o si malite ise ihe n'efere abacha ya nke mere o ji ere ahịa ọfụma. Ọ sị na nke malitere mgbe njọ ahịa na-eme ya, ọ hụru ka nwa ya ji mkpụrụ aṅara na-ese ihe n'efere na nke ahụ bunye ya uche pụrụiche. Ogbonna sị na ngwa ngwa o mere nke a n'efere abacha ya, na ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya, na ha malite ịbọ abacha ya ụbọ. Di ya bụ Mazị Ogbonna sị na ọ na-enyere nwunye ya bụ Blessing aka n'ime abacha a ha na-ere iji zụọ ụmụ ha. Onye mere ya, Vining Ogu Kirie ihe o kwuru n'uju; https://www.bbc.com/igbo/afirika-57400832 +politics Ekweremadu nwereike ịnọ na mkpọrọ gbaa ekeresimesi afọ a n'ihi... Ike Ekweremadu, bụbu osote Onyeisi ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa, nwereike ịnọ na mkpọrọ na mba Briten gbaa ekeresimesi nke afọ 2022. Cheta na e ji Ekweremadu eji n'ụlọmkpọrọ maka ebubo iji mmadụ atụ mgbere nakwa atụmatụ iji akjụkụ ahụ mmadụ agba mgbere. Ekweremadu, nwunye ya bụ Beatrice, nwa ha nwaanyị bụ Sonia na otu dọkịta aha ya bụ Obinna Obeta bụ ndị a nwụchiri n'ihi ebubo a, mana Ekweremadu na Obeta bụ ndị nọ na mkpọrọ ebe ụlọikpe tọhapụrụ nwunye ya na nwa ha ka ha si n'ụlọ na-abịa ikpe ha. Etinyeburu ikpe ahụ ka ọ dị n'ọnwa Mee afọ 2022, mana ọkaikpe Mark Lucraft bughachitere ya azụ ka ọ dịzie n'ụbọchị 31 nke ọnwa Jenụwarị. Mana ụlọikpe tinyere ụbọchị 16 nke ọnwa Disemba dịka mgbe a ga-ekpebi ma a ga-atọhapụ Ekweremadu. Ọ bụrụ na ikpe nke ụbọchị ahụ gaziere Ekweremadu, ọ ga-ahapụ ụlọmkpọrọ ma sizie n'ụlọ na-abịa ikpe, ma ọbụghị ya, mara na ọ ga-anọgide na mkpọrọ ruo Jenụwarị 2023. Ndị uweojii mba Briten jidere Ekweremadu na nwunye ya n'ọdọụgbọelu Heathrow, oge ha si mba Tọkị lọbata n'ọwa June afọ a. Ebubo e boro ha bụ na ha ji ụzọ aghụghọ kpọbata otu nwata nwoke dị afọ 21 na mba UK iji were akịrị ya. Ọ bụ oge a kpọgara nwata nwoke ahụ n'ụlọọgwu ebe a ga-anọ waa ya ahụ wepụta akịrị ya ka ọ nọrọ kwuo na ya agaghị eme ihe a gwara ya mee. Nwa amadị ahụ mechara gaa n'ụlọọrụ ndị uweojii ga mee mkpesa, nke mere ndị uweojii ji nwuchie Ekweremadu na nwunye ya. Iji chekwaa nwata nwoke ahụ a sị na Ekweremadu chọrọ iwere akịrị ya, ụlọikpe nyere iwu ka a ghara ịkpọpụta aha ya. Cheta na Ike Ekweremadu pụtaburu ịzọ ọkwa Gọvanọ n'Enugwu steeti n'afọ 2023, n'otu 'Peoples Democratic Party' (PDP) tupu o mechaa laghachi azụ. Ekweremadu anọọla n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa kamgbe afọ 2003. https://www.bbc.com/igbo/articles/cp4zg0v7nxvo +entertainment Zoro Swagbag: Echebum na m ga-abụ 'Engineer' maka nne m "Chimaobi Owoh bụ ọtiegwu a ma dịka Zoro bụ onye ji mbem Igbo akpalite ndị mmadụ mmụọ n'usoro agba ọhụrụ. N'akụkọ a, Zoro kọwara etu o si malite ịgụ egwu na etu o si chọọ ịbụ ""Engineer"" makana ọ bu ihe nne ha chọrọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49055445 +politics Ndi na-edebenye aha maka PVC n'afọ a ha aka afọ ndị ọzọ? Akụkọ apụtala ọtụtụ oge na nso nso a ebe imirikiti ndị mmadụ na-enupụta n'igwe iji debanye aha ha n'akwụkwọ ntuliaka, ma nweta kaadị e ji atụ vootu bụ Permanent Voter's Card PVC n'aha ịchafụ. Dịka ị marala, kaadị a bụ ihe ndị mmadụ ga-eji tụọ vootu n'ụbọchị ọbụla a na-eme ntuliaka. Ọtụtụ na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị na-achọ inweta PVC ha n'afọ a, karịrị ndị nke afọ ọzọ, mana nke a ọ bụ eziokwu? Ụlọọrụ Inec malitere inye Permanent Voters Card - PVC maka ntuliaka 2011. Tupu 2011, a naghi eji PVC atụ vootu, ọ bụ nke nwamgbenta a kpọrọ Temporary voters card - TVC. Mana dịka a malitere PVC, ndị aha ha dị n'akwụkwọ ndị Inec nwere ikike ịtụ vootu n'afọ 2011 bụ 73,528,040 dịka ndị Inec siri kwuo. Ndị gụnyere ma ndị ji kaadị nke nwamgbenta bụ TVC na ndị ji Permanent Voters Card - PVC. N'ime ndị a, ndị pụtara tuo vootu bụ 39,469,484 nke bụ pasenti 53.68 ndị binyere aka ịtụ vootu. N'afọ 2015, Inec kpochapụrụ TVC kpam kpam kwuo na ọ bu naanị ndị ji PVC nweerike ịtụ vootu. Ya bụ n'ime mmadụ nde 73,528,040, ndị ndị Inec nyere ikike ịtụ vootu bụ 67,422,005 mana ndị tụrụ vootu bụ naanị 29,432,083 naanị pasentị 43.65. N'afọ 2019, ndị denyere aha bụ 84,004,084 mana ndị Inec kwuru tozuru ịtụ vootu bụ mmadụ 68,833,476 mana ndị tụrụ vootu kpọmkwem bụ nnanị mmadụ 28,614,190 bụ pasentị 34.75 n'ime ndị denyere aha ha. N'ime mmadụ nde 10,057,130 denyere aha ha na Inec ma nweta PVC nwere ikike ịtụ vootu n'afọ 2019, ndị tụrụ vootu n'ezie bụ naanị mmadụ 2,701,746. Mmadụ 7,355,384 bụ ndị na-atụghị maọbụ na nke ha tụrụ adabaghị adaba. Nke a kpatara e jiri kwuo na ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nwere ihe a kpọrọ 'voter apathy' na Naịjirịa karịa mpaghara ndị ọzọ. Ugbua, ndebanye aha maka ntuliaka afọ 2023 na-aga n'ihu ugbua, mana ọ dị ka ihe dị iche dị. Ụlọọrụ Inec kwuru na ihe ruru mmadụ nde 10 edenyela aha n'afọ a, nke gụnyere mmadu 84,004,084 denyerela aha na 2019. Inec ewepụtabeghi aha niile e denyere na ndị tozuru ịtụ votu mana ihe eserese a gosiri etu ihe si kwụrụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ ugbua, ọnụọgụgụ ndị denyerela aha. Inec na-epụtara etu ihe si kwụrụ gbasara idebanye aha maka PVC na mpaghara Naịjirịa niile. Lee ụfọdụ ndị ha wepụtarala: Ọtụtụ ndị a ma ama na-eti egwu haziri ọgbakọ mkporindụ n'ama egwuregwu Tafawa Balewa na Legọs. Ha kwuru na ndị mmadụ agaghị akwụ ụgwọ iji sonye n'ọgbakọ, naanị PVC ka onye ọbụla ga-egosi iji sonye. Ha kpọkwara ndị ọrụ Inec ka ha bịa debanye aha ndị na-enweghi PVC. Ọtụtu ndị mmadu ekwuola na ụdị mkpu a na-eti maka iweta PVC nakwa ọnụọgụgụ ndị na-apụta maka ya ugbua bụ nke a hụbeghi ụdị ya mbụ. Ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ihe ịtụnanya nakwa ihe ha nabatara, maka na nke a nwereike iwelite ọnụọgụgụ ndị ga-atụ vootu n'afọ 2023 karia afọ ndị nke gara aga. Ka ọ dị ugbua, ha adọtịala ohere maka idenye aha gafee abalaị 30 ọnwa Juunu ha tinyeburu. Nke a bụ maka na ụloikpe nyere iwu ka a dọtịa ya, mana a mabeghi oge a ga-akwụsị ya. Ọtụtụ kwenyere na nke a ga-eme ka ọnụọgụgụ ndị ga-edebanye aha ha gbagotekwuo. https://www.bbc.com/igbo/articles/c2jvped0rrpo +sports Ernest Okonkwo: Ihe ndị mmadụ ejịghị echefụ Ernest Okonkwo, ọkpọka 'football commentator' larala mmụọ Ernest Okonkwo bụ onye ntaakụkọ egwuregwu wuru ewu ọfụma n'agbata afọ 1970s na 1980s oge ọ nọ ndụ maka etu o si agba ozi egwuregwu na Redio Naịjirịa. Ka oge na-aga, ọtụtụ ndị egwuregwu bọọlụ na-amasi ọfụma na Naịjirịa ka na-echeta Maazị Okonkwo maka etu ọpụrụiche o si agbasa ozi ya. Ọtụtụ na-ekwu na enweghị onye ọzọ dị ka nwoke ahụ baara ọtụtụ ndị egwu bọọlụ kpara ike n'agbata 70s na 80s aha dịka 'Mathematical Segbun Odegbami', 'Chairman Christian Chukwu, Emmanuel Ọkala 'Man Mountain' bụ aha a na-etu ha ruo ugbua. Ernest Okonkwo, onye Nando n'Anambara steeti nwụrụ n'abalị Asaa nke ọnwa Ọgọstụ,afọ 1990 ka ọ gbachara afọ 54. Ọ hapụrụ nwunye, na ụmụ ise mana nwunye ya mechara nwụọ n'afọ 2005 ka ọ gachara afọ 15. Nwa nwaanyị, Barr Amaka Okonkwo-Oboh, na-agbasotụ nzọụkwụ site ịbụ ọkaiwu iwu gbasaara egwuregwu were anya. Akụkọ kowara maka ya ọfụma. Ndị mere akụkọ a bụ Uche Akolisa na Chiemela Mgbeahụrụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58112686 +entertainment Etu m siri bụrụ nwunye Zebrudaya n'ejije ochie 'New Masquerade' - Lizzy Evoeme "Lizzy Evoeme bụ onye kpara agwa dịka Ovularia n'ejije ""New Masquerade"" nke wuru ewu na TV malite na ngwụcha ebe afọ 1980 ruo etiti ebe afọ 1990. N'ejije ahụ, Ovularia bụ nwunye Zebrudaya, nke onye ejije a ma ama bụ Chika Okpara kpara agwa ya. Na mkparịtaụka a, Lizzy Evoeme gwara anyị na ọ bụghị ya bụ onye mbụ kpara agwa dịka Ovularia, mana ọ bụ ya bụ onye a kacha mara n'ihi ya. Lizzy Evoeme kwuru na ya bụ onye Akabo dị n'okpuru ọchịchị Mbaitoli, Imo Steeti, mana di ya bụ onye Ngwa, Abia Steeti. O kwuru na ọ malitere na nwata gosipụtawa na ya nwere onyinye ọnatarachi ime ejije. ""Ma n'ụlọakwụkwọ, ma n'ụlọụka, oge ọbụla ihe ejije pụtara, ana m anọ ya,"" Lizzy kwuru. ""Enwere oge ndị otu 'Masquerade' si Enugu bịa Aba, ozi wee gbasaa na ha na-achọ onye ga-akpa agwa dịka Ovularia nwunye Zebrudaya, e wee kpọta aha m."" ""Oge m bịaruru ebe ahụ, e nye m akwụkwọ ka m gụọ, m gụọ ya, ha sị na m gụtara ya nke ọma. Ọ bụ otu a ka m si malite."" N'etiti afọ 2021, akụkọ fesara na Lizzy Evoeme anwụọla, mana akụkọ ahụ bụ akụkọ ụgha. Lizzy n'onwe ya gwara BBC Igbo na ya nọ n'ime ụlọ ya oge ụfọdụ ụmụụmụ ya bịara na-ajụ ya ma ahụ ọ dịkwa ya. ""Agwara m ha na onweghị ihe na-eme m, na ahụ siri m ike."" ""Dịka anyị na-ekwu okwu, ọtụtụ ndị mmadụ malitere ịkpọ ekwentị m, na-ajụ m ebe m nọ nakwa etu ahụ m dị."" ""Ọ bụ etu ahụ ka m sị nụ asịrị ahụ na-efegharị na ha anwụọla, ọ bụghị m."" ""Adị m afọ 80 n'ụma ugbua, ụmụ m amụọla ụmụ, ụmụ ha amụtakwa ụmụ."" ""Ọ bụ Ngọzị Chineke. Enwekwara m olile anya na Chineke ga-edebe m ndụ na-aga n'ihu."" Ọtụtụ n'ime ndị so n'ejije 'New Masquerade' alaala mmụọ ugbua. Ha gụnyere Romanus Amuta (Naatị), James Iroha (Giringori), Christy Essien Igbokwe (Akpenọ), na Claude Eke (Jegede Sokoya). Mana Lizzy Ovoeme kwuru na ya na Zebrudaya ka na-akparịta nke ọma. ""Mụ na Zebrudaya na-ekwu nke ọma n'ekwentị. Ọ na-akpọ m ugboro ugboro."" Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi na Vining Ogu." https://www.bbc.com/igbo/60918190 +politics Obi Onitsha agaghị izute Atiku n'obi gọọmentị, ọ bụ nghọtaghie - Ọnụ na-ekwuru Obi Onitsha "Njem achụmnta vootu nakwa ileta Gọvanọ Anambra steeti nke Atiku Abubakara gara n'Anambra steeti n'ụbọchị Tọzde akpalitela okwu n'ọnụ ọtụtụ mmadụ. Mgbe Atiku bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 gara Anambra, o kwuru na ọ bụ ya bụ ụzọ ndị Igbo ga-esi nweta ọkwa ọchịchị. Nke a mere ka ụfọdụ mmadụ malite ịkatọ ya maka okwu a na soshal midia na-ekwu na okwu ya adabaghị n'ihi na e nwere onye Igbo so azọ otu ọkwa ahụ. Okwu ọzọ mapụtara na njem Atiku Abubakar n'Anambra bụ gbasara ma Obi Onitsha bụ Igwe Nnaemeka Alfred Ugochukwu Achebe a gara zute Atiku Abubakar n'obi gọọmentị. Ụfọdụ ndị mmadụ katọkwara Igwe Achebe maka nke a na-ekwusi ike na o metaghị ya dịka ọ bụ Atiku n'onwe ya kwesiri ịbịa zute ya n'Obieze ya iji kwanyere ya ugwu dịka o si mee ndị Igwe ndị ọzọ n'akụkụ Naịjirịa ndị ọ garala. Mana ọnụ na-ekwuchitere Obi nke Ọnicha bụ Nnaemeka Maduegbuna gwara BBC Igbo na ọ bụ nghọtaghịe si n'aka ndị mmadụ. O kwuru ""Obi na-achị Ọnịcha gara nzụkọ ndị Igwe Anambra bụ 'Anambra state Traditional Council', ọ bụ ebe ahụ ka ọ nọ zute Atiku"". Ọ gara n'ihu kọwaa na Atiku n'onwe ya abịaghị ịhụ Obi na-achị Onitsha n'ihi na ọ kaara ịbịa n'Obieze ya maọbụrụ ya ka ọ bịara ikele. ""Ndị otu PDP ekwubuola na Atiku na-abịa Anambra steeti izute Gọvanọ Chukwuma Soludo, ndị Igwe Anambra steeti nakwa ndị nkwado ya nọ na steeti ahụ, ọ bịaghị ikele Obi nke Onitsha n'onwe ya"". Ọ gara n'ihu kwuo na Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'aha otu Labour Party zutekwara ndị Igwe ndị ahụ n'otu ụzọ a mgbe ọ bịara njem n'Anambra steeti ọnwa ole na ole gara aga." https://www.bbc.com/igbo/articles/cy70z45r0g7o +politics Haiti President killed: Ihe niile i kwesiri ịmata maka ogbugbu Onyeisiala Jovenel Moïse nke mba Haiti "Ndị uweojii mba Haiti sị na ọ bụ mmadụ 28 si mba ọzọ gụnyere ndị agha mba Colombia bụ ndị e gobiri ka ha gbagbuo Onyeisiala mba ha bụ Jovenel Moïse.. E gburu Moise n'ụlọ ya ụbọchị Wenezde, abalị asaa nke ọnwa Julai (7/7/2021). Ndị uweojii kwuru na ha nwụchiri ndị omekome dị 17 ka ha kwachara mgbọ n'isiobodo mba ahụ bụ Port-au-Prince, ebe a nwuchiri ụfọdụ n'ụlọ ebe ha nọ were na-arụ ihe ha na-arụ, ebe a nwụchiri ndị ọzọ dịka ha wabara n'ụlọnnọchiteanya Taiwan na mba ahụ. Ndi uweojii gbagburu atọ, ebe ha ka na-achọ mmadụ asatọ ndị ọzọ. Ndi uweojii gosiri ndị ntaakụkọ ndị a ana-enyo enyo dịka ọbara na apaọnya juchara ha ahụ Ụbọchị Tọzde ma gozikwa ngwaọgụ ha jiri kpaa ike. Ka o di ugbua o dobeghị anya onye kpara nkata ahụ ghọrọ ngịga na ebunobi ya. Cheta na ọ bụ n'ụzọ ụtụtụ Wenezde ka ndị bu egbe wakporo ụlọ onyeisiala dị na Port-au-Prince, gbagbuo ya, ma merụọ nwunye ya ahụ. Ndị nọ n'ọchịchị kwuru na a hụrụ Moïse, gbara afọ 53, ka ọ tọgbọ n'ozu , apa mgbo dị 12 n'mkpụrụ anya gbapụtara ya. E fegala Martine Moïse, dị 47, bụ onye meruru nnukwu ahụ Florida dị na mba Amerịka maka nleta. Ndị uweojii kwuru na ndị rụrụ Moise mgbuka bukartrị ndị Colombia, ebe ndị Haiti abụọ bụkwa ndị Amerika sokwa ha. Ụọọụ ntakụkọ Le Nouvelliste kwuru na a hụrụ ngwaọgụ, dọla, akwụkwọ ego onyeisiala, ha igwe kọpụta e ji ahazi onyonyo nzuzo n'ụlọ onyeisiala. Mba Taiwan kwetara n'ezie na mmadụ 11 n'ime ndị a na-enyo maka ịkpa mkpamkpa bụ ndị a nwuchiri dịka ha wabatara na ngwuru ha. Ndị nkiti iwe ji soro na-achọị ndị ahụ bu egbe ma nyere ndị uweojii aka inweta ụfọdụ ebe ha zoro n'ọhịa. Igwe mmadụ sunyere ụgbọla atọ nke ndị a na-achọ achọ site n'etu ahu bibie ihe akaebe. Otu nwoke gwara ụlọakụkọ AFP sị, ""Obi adịghị anyị bụ ndị Haiti mma maka ihe mere. Anyị anabataghị ya."" ""Anyị dị njikere Inye aka n'ụzọ abụla ụzọ n'ihi na anyị chọọ ịmata onye kpara nkata ahụ, aha ha, ebe ha si, ka e were nwee ikpe nkwomoto."" Ọnwụ Moise butere mgbakwojuanya onye kwesịrị iji ọchịchị ganye ma mba ahụ mee ntuliaka. Iwu ala ahụ edochaghị anya n'ihi na enweghị ụlọomeiwu na mba ahụ ugbua. nsogbu bụ ihe mere na ntuliaka nke e kwesịburu ime n'ọnwa Oktoba afọ 2019 emeghị. Mmegharị Iwu kweiburu inye ohere ka JClaude Joseph bụ Praim Minista weghara ọchịchị Mana a na-ekwu na iwu akwadoghị ọnụnọ Joseph n'Ọkwa ya. A kpọpụtaburu Ariel Henry dịka onye prime minista ọhụru mana e dubeghị ya n'iyiọrụ tupu ọdachi ahụ adaa. Otu United Nation na-atụ alo Ka Joseph jide ọchịchị rue oge a ga-eme ntuliaka na ngwụcha afọ a. Ndị uweojii na mba Haiti ekwuola na ha egbuola mmadụ anọ ha na-eche na-aka ha dị n'ogbugbu onyeisiala mba ahụ bụ Jovenel Moïse ma merụọ nwunye ya ahụ n'ụlọ ya dị n'isiobodo mba ahụ bụ Port-au-Prince. Ndị uweojii sịkwa na ha nwuchiri mmadụ abụọ aka ha dị n'ihe a. Cheta na Praim Minista mba ahụ bụ Claude Joseph kwuru na ndị bu egbe amaghị ndị ha bụ wakporo be onyeisiala n'Elekere Mbụ. Joseph kporo oku ka onye ọbụla dere jụụ dịka""a na-agba mbọ ịhụ na ọchịchị a na-aga n'ihu."" Moïse gbara afọ 53 banyere ọchịchị kemgbe afọ 2017 mana ngagharịiwe ebe a na-akpọ oku ka ọ rituo n'ọkwa karịrị dịka ụfọdụ na-ebo ọchịchị ya ebubo nrụrụaka. Joseph kpọrọ mgbagbu Onyeisiala ""arụ ka arụ ekweghịghị ekwesị"" dịka o kwukwara na ndị mere ya bụ ihe na-asụ asụsụ ""Bekee"" na ""Spanish"". O kwughị ihe ọzọ karịa ihe ndị a. O kwuru na a na-elebara ọnọdu ụkọ mba ahụ nọ na ya, gaa n'ihu sị, ""ọchịchị onyekwuoucheya na obodo a ga-enwe mmeri"". Praim Mịnịsta mba Briten bụ Boris Johnson kwuru n'akara Twitter "" ọnwụ Moise ""juru"" ya anya anya ma ""wute"" ya. Ụlọọrụ Onyeisiala Mba Amerịka kwụrtụ na ya bụ mpụ bụ 'arụ kwọ nwa"". Mba Dominican Republic bụ agbataobi Haiti enyela iwu ka e mechie agbata ha abụọ ozigbo ozigbo Ka ọ dị ugbua, nwunye Moise na-anara ọgwụ n'ụlọọgwụ mana ọnọdụ ọ nọ edobeghị anya. Ndị anọghị na gọọmentị na mba ahụ na-ekwu na ọchịchị Moise kwesiburu ịbịa na njedebe n'abalị asaa nke ọnwa Febrụwarị afọ 2021, nke bụ afọ ise onye nọbu n'ọkwa onyeisiala mba ahụ tupu ọ banye bụ Michel Martelly,rịturu n'ọchịchị. Onyeisi ndị uweojii na Haiti bụ Leon Charles kwuru na ha chebiri ndi a n'ụzọ. Ọ sị: ""Mmadụ anọ n'ime ndị a nwụrụ oge anyị zutere ha. Anyị zọpụtakwara ndị uweojii atọ ha nwuchiri n'oge ha na gburu onyeisiala anyị."" ""Anyị gbochiri ụzọ ha si ala dịka ha kpachara arụ a. Anyị na-ebuso ha agha kemgbe ahụ."" Akụkọ ka na-abịa" https://www.bbc.com/igbo/afirika-57753205 +sports Anthony Joshua vs Andy Ruiz: Etu Anthony Joshua si 'kwadoro' Ruiz Jr "Nwaafọ Naịjirịa bụ Anthony Joshua ga-ezute Andy Ruiz Jr na Saụdị Arebiya n'abalị Satọde a maka asọmpị nke abụọ ha nke ha ji azọ ihe nrite Bekee kpọrọ ""World Heavy Weight Boxing Championship"". Nnukwute ọgụ na-eche mmadu abụọ na ọkpọ mpịagharịa ha ga-akpịa n'ama egwuruegwu Diriyah bụ ebe ga-abata mmadụ 15,000. Ọ bụ n'elekere asatọ nke ehihe (8:30 PM) n'oge Naịjirịaa ka a ga-amalite isu ha bu ọkpọ. Ọ bụ n'ọnwa Juun nke afọ 2019 ka Ruiz Jr narala Joshua ihe nrite niile oji aka mgbe ha zutere na obdodo New Yọk. Joshua sị: ""A no m ebe a imeri, egwu adịghị atụ m..., ekperem ekpere ma wepụta ohere ji nabata ihe ga-eme n'Satọde""" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50698915 +entertainment Ofo Igbo: Ihe dị iche na ọfọ, ọfọ ndị ichie na mkpụrụ ọfọ "Ọfọ bụ osisi a na-ahụta nanị na mpaghara ọdịda anyanwụ nke ndị sayensị na-akpọ ya Detarium Senegalense. Mgbe ọbụla ọfọ batara n'obi onye Igbo, ọ bụ osisi eji mara ndị Ichie, Nze maọbụ Ọzọ. Mana n'ala Igbo, a na-ejikwa mkpụrụosisi ọfọ esi ofe. Ọtụtụ ndị ntorobịa na-eche na o nwere ndịiche n'etiti osisi ọfọ na ọfọ nke e ji esi ofe. Iji wepụ nghọtaghie a, BBC Igbo kpọtụrụ Chigozie Nnabuihe onye bụ ọkammụta n'ihe gbasara ala Igbo, ka ọ tinye ọnụ na ya bụ okwu. Ọkammụta Nnabuihe bụ onye nkụzị asụsụ na Omenala Igbo na mahadum gọọmentị etiti nke dị na Legọs steeti. Lee etu ya bu mkparịta ụka maka ọfọ siri gaa Ọkammụta Nnabuihe kwuru na osisi ọfọ bụ osisi bụrụ ibu dịka ọsịsị Apụ, Ụgba maọbụ Ọji. O kwukwara na ndị Igbo nyere ọfọ ọnọdụ dịka osisi eji ekwu eziokwu, ikike e ji akwụrụ n'ụzọ eziokwu na ikike eji ahụ na enweghị onye a na-emegbu. Ọ kọwara na ọ bụ ya mere ndi Igbo ji ekwu, "" O ji ọfo ga-ala"". O kwuru sị. ""Ndị ọcha amaghị ihe ha ga-akpọ osisi ọfọ. Ọ bụ nanị n'ọdịda anyanwụ Afrịka ka a na-enweta osisi ọfọ"". Nnabuihe kọwara na dịka ụdara na ụfọdụ osisi ndị ọzọ, na anaghị ata ya ata kama eji ya esi ofe. Ọ kọwara si ""a na-eji mkpụrụ ime ya esi ofe, eji ya eme ka ofee rọọ arọ."" Nnabuihe kwuru sị na onye chọrọ ịmetọ ọfọ ga, ""e nwere osisi a kpọrọ agbalị kee n'ukwu ọfọ, mgbe e mere nke a, mkpụrụ niile nọ na ya bụ osisi ga-adasịsị n'ala"". Nnabuihe kwuru na e nwere usoro e ji enweta osisi ọfọ nke ndị Ichie na-eji. Ha gụnyere: Nnabuihe mere ka anyị ghọta na ọfọ bụ mgbe mmadụ soro usoro anyị depụtara na mbụ, nke bụ na Ojiọfọ awakeela ya. O kwuru sị, ""ụfọdụ na-aga tụtụrụ osisi ọfọ ha hụrụ n'ala na-esoghị usoro mwaake, ihe a na-ekwu bụ na onye ahụ ji mkpịsi ọfọ"". Kama Nnabuihe kọwara na onye gara were mma gbute ọfọ nke ya, ihe ana-ekwu bụ na onye ahụ ji osisi apịrị apị. N'asụsụ Igbo, mmadụ iji ọfọ pụtara mmadụ ịkwụwa aka ọtọ, ikwu eziokwu, nakwa izere ihe ọjọọ. Ndị Igbo na-ekwu okwu dịka: ""Ejikwaara m gị ọfọ na ogu"", ""Ihe onye na-eme ya jidekwa ọfọ"", dịrị gawazie. Mgbe a kpọrọ ọfọ n'ụzọ dị otu a, ọ pụtaghị ọfọ nke a na-ahụ anya, kama ọ bụ iji gosi eziomume. Ọkammụta Nnabuihe kwuru sị, ""Ọ bụ osisi ọfọ mịtara mkpụrụ nke e ji esi ofe ma ọ bụ kwa alaka ya ga-eji mere ọfọ ndị ichie"". Ọ chịkọtara ya were si, ""Ọfọ bụ ike, ọfọ bụ ndụ, ọfọ bu Igbo""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56944969 +politics Lai Mohammed ọ rịorọ Obi Cubana ego maka ịkwụ ụgwọ Naịjirịa ji?Lee ihe anyị ma "Lai Mohammed bụ minista mgbasaozi Naịjirịa suru akara akụkọ ụgha n'ebe edepụtara na ọ rịọrọ Obi Cubana bụ onye azụmahịa na-ewu kamgbe ngwụcha izu ụka a ego e ji akwụ ụgwọ Naịjirịa ji. Mohammed depụtara nke a n'akara Facebook ngalaba na-ahụ maka mgbasa ozi na omenaala na Naịjiria nke ọ bụ minista ya. E depụtara akụkọ ụgha fegharịrịnụ etu a ,""Obi Cubana nke Anambra nwere udiri ego a , Naịjiria wee na-agba mbibi n'aka mba China. Cubana nyetụ Naịjirịa ego. Obi Iyiegbu e ji Obi Cubana mara wuru ewu na ngwụcha ịzụ ụka maka etu o si wepụta nnukwu ego kwa nne ya nwụrụlanụ n'ọba dị n'okpuruọchịchị Idemili South dị n'Anambra ma nata ọtụtụ onyinye n'aka ndị ọyị ya. Ọtụ onyonyo ndị mmadụ setere na ya bụ mmemme na-egosi ebe ndị ama ama nakwa aka ji akụ n'efe nnukwu ego na mmemme Obi Cubana. Ọtụtụ ndị ama ama gụnyere Cubana chief priest (onye ọrụ Obi Cubana), Davido, D'Banj, Phyno nakwa ọtụtụ ndị na-eme ihe nkiri ba Nollywood. Etu e si fee ego na mmemme akwamozu Obi Cubana mere ka ọtụtụ ndị mmadụ kwuwe ka Obi Cubana binye Naịjiria ego. Ụfọdụ na-ajụ kedụ ka Obi Cubana si akpata ego ya. Ego Naịjirịa ji n'ụgwọ agbagotela kamgbe onyeisiala Muhammadu Buhari banyere ọchịchị. Okpa ọchị ama ama bụ Uche Williams Mba gosiri onyoonyo etu o si gaa ya bụ akwamozu ma kwuo na n'ikpeazụ onye ọbụla bụ ndị nwụrụanwụ ka dị ndụ. Kanayo O kanayo na-eme ihe nkiri Nollywood pụtakwara kwuo n'onyonyo na-efegaharị na soshal midia na onye ọbụla na-achọ ọyị nwaanyị gawa Oba makana ebe ahụ ka ihe niile na-eme." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57885105 +entertainment Ọtụtụ ndị a ma ama na-etigharị egwu m na-anataghị m ikike - Madam Ladder "Otiegwu ụka bụ Agnes Iroh a ma dịka ‘Madam Ladder’ akọwarala BBC Igbo ọtụtụ ihe banyere ndụ ya nke ọha amaghị maka ya. Na mkparịtaụka a, Iroh kọwara etu ụfọdụ ndị ọkachasị ndị otiegwu a ma ama sị ewere ma na-etighari egwu ya dịka ụzọ ha si akpata ego mana ha anaghị anata ikike n’aka ya tupu ha e mee nke a. O ji ndị otiegwu abụọ bụ Olamide Gbenga Adedeji, onye a ma dịka 'Olamide', nakwa Tim Godfrey nye ọmụma atụ. Dịka o si kwuo, Olamide tinyere olu ya bụ Madam Ladder n'egwu nke ya onwe ya bụ Olamide, na-anataghị ya ikike ọbụla, ebe Tim Godfrey gụgharịrị egwu ya a kpọrọ 'nara ekele', na-anataghị ya ikike. BBC Igbo gbara mbọ ịnụ n'ọnụ ndị otiegwu abụọ a bụ Olamide Gbenga Adedeji, nakwa Tim Godfrey, mana ọ mịtaghị mkpụrụ. Ha abụọ azaghị ekwentị ha maọbụ zaghachi ozi anyị zigaara ha n'ekwentị, na whatsapp nakwa 'email'. Naịjirịa nwere iwu a kpọrọ 'Copyright Act' nke e wepụtara n'afọ 2004. Iwu a gbochiri onye ọzọ imegharị maọbụ rụgharịa ihe ọbụla mmadụ chepụtara n'onwe ya dịka akwụkwọ e dere ede, abụ, ihe eserese, ihe ejije onyonyo, maọbụ egwu akụpụtara akụpụta. Iwu a hibekwara ngalaba a kpọrọ 'Nigerian Copyrights Commission' bụ ndị ọ dị n'aka ịhụ na mmadụ ọzọ ewereghị egwu, maọbụ ejije, maọbụ eserese onye ọzọ, megharịa ya ma were ya na-akpara ego. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Oriaku Agnes Iroh (Madam Ladder) kwuru na oge ha malitere iti egwu, ""ọ bụghị maka ego ka anyị ji banye ya"". ""Ihe na-anụ anyị ọkụ n'obi bụ ito Chineke, na ime ka ndị mmadụ chegharịa sowe Chineke,"" ka o kwuru. Ọ kọwara etu njem ya n’ọrụ iti egwu siri malite ma kọwapụta ụfọdụ ihe ndị cheere ya aka mgba mgbe ọ malitere ya bụ ọrụ. Iroh kọwara etu ihe siri gbanwe n’ụwa ugbua nakwa etu mgbanwe a siri metụta atụmatụ iti egwu ya nakwa ihe ndị ọzọ na ndụ ya. O jikwa olu ya na-atọ ka mmanụ aṅụ gụọ ụfọdụ egwu ya a ma ama nakwa ndị o kwuru na-amasị ndị nso nso ya. Na nchịkọta, ọ dụkwara ndị ntorobịa ndụmọdụ ka ha dị ụchụ n’ọrụ ha ugbua n’ihi na ime nke a ga-ahụ na ọrụ aka ha mịpụtara mkpụrụ ma ọ bụghị taa, ọ ga-eme n’oge na-adịghị anya." https://www.bbc.com/igbo/articles/c1rdzjl03y2o +business Chinmark: Chinedu Marksman bụ enyi m, agaghị m agọnahụ ya, ọ naghị agba ọsọ - Harrison Gwamnishu "Harrison Gwamnishu bụ nwa okorobịa a ma ama na soshal midia maka inyere ndị mmadụ aka n'ụzọ dị icheiche. Mana ugbua, ndị mmadụ kpụ aha ya n'ọnụ dịka ụlọọrụ ọ na-etiburu mkpu, bụ Chinmark, mechiri. Chinmark bụ ụlọọrụ nke onye nwe ya bụ Chinedu Marksman Ijioma. Gwamnishu kọwara na ya na Chinedu Marksman mabu n'oge gara aga tupu ọ malite ụlọọrụ Chinmark. O kwukwara na Chinmark na-enyetụ ya ego iji nyere ndị mmadụ nọ na mkpa aka. Mana ya onwe ya bụ Gwamnishu abụghị onye otimkpu Chinmark, ọ bụghị onye nnọchite anya ha, ego ya adịghịkwanụ n'ụlọọrụ ahụ. ""Ihe m na-eme bụ na ana m ekesa ozi gbasara ụlọọrụ Chinmark n'akara Facebook m,"" Gwamnishu kwuru. ""Onweghị onye ọbụla m kpụụrụ n'aka ka o tinye ego ya n'ụlọọrụ Chinmark."" ""Onye ọbụla hụrụ ihe Chinmark nwere n'ebe dị icheiche ga-enwe mmasị itinye ego ya n'ụlọọrụ ahụ."" ""Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji tinye ego ha, mana ị hụlanụ etu ya bụ ihe si dị ugbua."" Gwamnishu kwuru na ego ndị mmadụ agaghị efu, maka na ụlọọrụ Chinmark nwere ọtụtụ ihe ha nwere ike ire iji kwụghachi ndị mmadụ ego ha. Kama ọ nyere ndị tinyere ego n'ụlọọrụ ahụ ndụmọdụ ka ha bịakọta ọnụ, ka ya onwe ya bụ Gwamnishu kpọrọ ha gakwuru Chinedu Marksman ka ha mara etu ha ga-esi mee ya bụ ihe. N'ọdị nso a ka ngalaba gọọmentị a na-akpọ 'Securities and Exchange Commission' kwuru na ụlọọrụ ahụ bụ nke adigboroja, ma mechie ya. Ndị SEC jichikwara ego niile ụlọọrụ ahụ nwere n'ụlọakụ nke pụtara na ha enweghị ike ịkwụ ọtụtụ ndị mmadụ tinyere ego ha na ya bụ ụlọọrụ ụgwọ ọmụrụnwa ha. Mana Chinedu Marksman kwuru na ha na-aga ije ya iji mata ma SEC ọ ga-akpọpere ha ọbaego ha niile. Onye bụ Chinmark? Chinedu Ijomah na-ewu kemgbe na soshal midia maka etu ndị mmadụ si pụta na-ekwu na o kweghị akwụ ha ụgwọ o ji ha dịka ụfọdụ n'ime ha tinyere ego ha n'ụlọahịa ya iji nweta isi ego na ọmụrụnwa. Ọ bụ onye a maaama ka onye ojiego achọ ego nwere ọtụtụ ụlọọrụ ebe ana-akọ ugbo, na-agbasa ozi ma na ụlọoriri. Ndị mmadụ ma ya dịka onye na-enye ọha aka. O lụọla nwunye ma mụkwa ụmụ. Mana Chinedu Marksman kwuru na ha na-aga ije ya iji mata ma SEC ọ ga-akpọpere ha ọbaego ha niile." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-60918197 +health Coronavirus in 60 seconds: A na-agwọta coronavirus agwọta? Ọtụtụ ndị mmadụ n'akụkụ ụwa niile agbakeela nke ọma n'ọrịa coronavirus. Mana ụfọdụ ndị mmadụ ka na-akpaso ndị dị otu a agwa ọjọọ. Ha na-eche na anaghị agwọta coronavirus agwota, nke na onye gbakerela n'ọrịa a ka nwekwara ike ibufe ya ndị mmadụ. Nke a abụghị eziokwu. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Adline Okere, Nnamdi Agbanelo na Chukwunaeme Obiejesi https://www.bbc.com/igbo/afirika-52302784 +business Etu ọtanisi mba UK ga-esi metụta gị? "Akụ na ụba mba UK malitere ịdatụ kamgbe ọnwa Eprelu na Juun dịka atụmaatụ etu a ga-esi gbochi mfesa coronavirus kwanyere ha n'ọtanisi (recession). Nke a butere nsogbu dịka ọchụchụ ọtụtụ mmadụ n'ọrụ nakwa ndatụ etu ndị mmadụ si ewepụta ego iji goro ihe. Mana kedụ ka ya bụ ọtanisi ga-esi metụta ndị Afịrịka ha na mba UK nwere mmekọrịta? Onye o ji ego achụ ego nakwa onye bụbụ onyeisioche 'Nigerian Economic Summit Group', Sam Ohuabunwa, kwuru na ọtanisi a ekwesighị ịtụ ụwa n'anya makana nsogbu covid-19 bu bia, tinyere ụwa n'ọgbaghara. O kwuru na mba ndị ọzọ ka ga-aba ọtanisi makana ha amalitechabeghị azụmahịa na ihe ndị ọzọ na-ewebata ego na mba ha. Nsogbu coronavirus mere ka ọtụtụ ụlọahịa kwụsị ma chụọ ọtụtụ ndị ọrụ nke butere ndatụ akụ na ụba. 1.Ndatụ enyemaka Ohuabunwa kwuru na ọtụtụ mba nọ n'Afịrịka ka na-ele anya enyemaka n'ebe UK na mba ndị ọzọ tolitere etolite nọ, nke mere na ọ bụrụ na ha banye ọtanisi, ọ ga-eme ka ha welata aka n'enyemaka ha na-enye mba ndị a maka nsogbu nke ọrịa coronavirus butere. 2.Njem na nlegharị anya Ọ ga-emetụta etu ndị mba UK si aga njem n'Afịrịka makana ọtụtụ n'ime ha enweghịzị ọrụ na-enye ha ego ha iji aga njem. Jimi Ogbobine bụ onyeisi nnyocha n'ụlọọrụ na-ahụ maka akụnaụba, kwuru na mba dịka Kenya ga-ahụ ndatụ ndị na-eme njem nlegharị anya na be ha. 3.Ndatu ego ndị Naịjirịa nọ na mba ofesi na-ewebata Ogbobine kwuru na nnyocha ụlọọrụ ha mere nso nso a na-egosi na mba UK kacha ewebata ego na Naịjirịa a kpọrọ disapora remittances na bekee. Ha ji pasenti ruru iri atọ na ise maọbụ iri anọ wee gafee mba ndị ọzọ na-ewebata ego a. Mana Ogbobine na-ekwu na ego ahụ ruru ijeri dọla iri abụọ na ise (25 billion dollars) kwa afọ ga-adatu ruo ijeri dọla iri abụọ (20 billion dollars) sọsọ n'afọ a. Nke a ga-eme ka ndị Naịjirịa maọbụ Afịrịka bi na mba ofesi ghara ị na-ewenata ego eji arụrụ ha ihe n'ụlọ makana ọrụ adịghịzị. 4. Mbuli ọnụ ego ngwa ahịa Ohuabunwa kwuru na ọnụ ego ngwa ahịa ga-ada ọnụ na UK makana ọtanisi na-ebute ihe ndị bekee kpọrọ ""inflation."" 5. Enweghị ọrụ ga-agbagolite Ọtanisi a ga-eme ka ndị mba UK gbado anya n'inye ndị be ha ọrụ dị adị tupu ha chọwa ndị Afịrịka nwereike ịrụrụ ha ọrụ, Nke a ga-eme ka ha nye naanị ndị ga-ewulite akụ na ụba ha ọrụ. Ohuabunwa kwetere na olileanya dị tụmadị n'afọ 2021 makana a na-ele anya iwepụta ọgwụmgbochi coronavirus n'oge ahụ. Nke a ga-eme ka mba UK na ụfọdụ mba gbakee na ndatu akụ na ụba ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53748529 +sports Kelechi Arsenal: Dịka onye nkwado Arsenal, nwaanyị ọbụla agaghị emewali gị obi "Otu bọọlụ Arsenal nke mba England so n'otu bọọlụ a kacha anụ ha anụ na mba ụwa niile. Mana n'afọ ole ma ole n'ọdị nso a, ya bụ otu bọọlụ anaghị emecha ọfụma etu ndị nkwado ha si atụ anya. Kelechi Anyikude bụ onye nkwado ndị otu bọọlụ Arsenal a ma ama n'ụwa niile dịka Kelechi Arsenal. O kwuru na dịka onye nkwado Arsenal, onweghịzi ihe nwereike imewa ya obi, ""maka na Arsenal emewaala m obi ugboro ugboro, mana enweghị m ike ịhapụ ha."" Ihe e ji mara nwa amadi a bụ maka otu o si eke ekike ma ọ na-aga ikiri asọmpi ndị Arsenal. Kelechi Arsenal na-eke ekike e ji mara ndị Igbo oge niile iji kọwaara ndị ọcha na omenala Afrịka amaka. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọdị nso a, o kwuru na etu a o si eke ekike emegheerela ya ọtụtụ ụzọ. ""Ezenwaanyị England eziterela m ozi ma gwa m ka m bịa n'obi ya,"" Kelechi kwuru. ""Mụ na ọtụtụ ndị a ma ama ezutekwala n'ihi ya."" ""Nke a bụ ụzọ m si egosipụta ihe ọma dị icheiche dị n'omenala Igbo nakwa ụzọ ndụ ndị Afrịka."" Kamgbe afọ 2006, Arsenal esonyebeghị n'asọmpi 'Uefa Champions League', nke bụ asọmpi otu bọọlụ ndị nwere agba na mpaghara Europe niile. Ọ bụ ndị nọ n'ogogo mbụ ruo ogogo anọ n'asọmpi bọọlụ nke England na-etozu isonye na UCL. Mana Kelechi kwuru na o nwere olileanya na Arsenal ga-etozu isonye na UCL n'afọ a. Ka ọ dị ugbua, otu Tottenham bụ ndị nke anọ na tebulu EPL ebe Arsenal bụ ndị nke ise." https://www.bbc.com/igbo/61538842 +health Lock Down in Nigeria: Gbanahụ oke ibu, 'afọ beer' site n'iri nri ndị a n'oge a "Ị na-atụ ụjọ ibu oke ibu maọbụ inwe 'afọ beer' n'ihi ọnọdụ nọrọ n'ụlọ nke gọọmenti manyere onye ọbụla ruo? Nwanne bute oche ka ị gụọ ihe nwada Igbo a bụ ọkammụta gbasara nrị na ihe o na-enye n'ahụ kpọpụtara dịka nri ị nwereike iri wee gbanahụ ọrịa ịnọ otu ebe na-ebute Nọọsụ Adanna Monday kwuru na ugbua ohere ịnọ n'ụlọ dapụtara, ọ dị mkpa ka onye ọbụla jiri aka ya na-esi nri ya ugbua. O kwukwara na mmadụ kwesiri ị na-ahazị oke nri ọ na-eri kwa mgbe. N'okwu ya, ""iri ezigbo nri ga-eme ka ọrịa dịka oke ibu, ọbara mgbali elu, diabetes, gbaara mmadụ ọsọ."" 1. Mkpụrụ osisi Nọọsụ Adanna kwuru na irikarị mkpụrụ osisi ga-eme ka ọrịa ịnọ otu gbalaga. Ụfọdụ mkpuru osisi ọ gụputara gụnyere orọma, 'lemon', 'strawberry', na mango bu ezigbo vitamin C ebe water melon ga-enye gị ezigbo mmiri n'ahụ. Apple bụkwa mkpụrụosisi ga-enye gị nnukwu ""Fibre"" ga-edozi ahụ gị. Riwe ụgụ na spinach ọfụma maka na 'green' ha tọrọ atọ dịka dọkịta Adanna si kwuo. Nke a ga-enye gị ihe ndị nwereike iluso nje agha n'ahụ gị. Ọ na-abụ ịhụ anụ ehi ahụ a na-ama gị jiji? Biko ọ bụghị maka oge a. Nọọsụ Adanna kwuru na anụ dịka azụ ọcha(crocker maọbụ tilapia), anụ ọkụkọ maọbụ anụ 'turkey' na ka mma n'oge a maka ịgbanahụ ọrịa. Nke a ga-eme ka ahụ gị ghara ị na-anyị gị arụ mgbe niile. 4. Kabọhidreti pụrụ iche Dọkịta Adanna gụpụtara nri a dịka osikapa ọfada , osikapa nke si n'ubi ghara ịgabiga ọtụtụ mgbanwe. Ọ gụnyere beans, potato na legume niile makana ha ga-eme ka ịghara ị na-ata cham cham. Nri ndị a bụ nọtụ, salmon, olive oil, Mackerel na ube oyibo. O kwuru na nri ndị a na-edozi obi mmadụ mana ọ ga-adị mma ka mmadụ ghara iribi ga ya oke maka ibu, tụmadị ọ bụrụ na ị na-agbara ibu ọsọ. Nke a bụ makana ha bu ibu karịa protein na kabọhidret. N'ikpeazu, dọkịta Adanna kwuru ka ndị mmadụ na-aṅụ mmiri ọfụma n'oge a. Ọ bụrụ na o kweghị gị, gote mkpuru osisi juputere na mmiri dịka 'water melon' tawa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52165477 +politics Collins Nweke: Nwaafọ Igbo zọtara ọkwa ọchịchị ugboro atọ na Belgium "Collins Nweke bụ nwaafọ Naịjiria gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara ka ọ nọrọ n'ọkwa ọchịchị ugboro atọ na mba Beljiọm. Nweke rụrụ dịka kanselọ na-ahụ maka mmekọrịta mmadụ na mmadụ a na-akpọ ""social affairs"" na Bekee, n'obodo Ostend dị na mpaghara West Flanders. Nweke bụ onye mbịarambịara mbụ na-azọta ọkwa ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụ ""oke ego"" dị na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa kpatara na ọchịchị anaghị eru ndị o kwesịrị iru aka. O kwuru sị na ndị na-akwụba aka ha ọtọ na Naịjirịa buo ibu, na Ala Igbo na Naịjirịa niile ga-emecha dị mma. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49247325 +health Covid-19 n'otu nkeji: Mmechi obodo na-enye aka igbochi mfesa coronavirus Dịka onyeisiala Muhammadu Buhari gbatịrị ọnọdụ onye nọrọ n'ụlọ, ndị mmadụ amalitela ịtamu nnukwu ntamu. Ọtụtụ na-ekwu na ọbụghị atụmatụ dị otu a ga-egbochi mfesa ọrịa coronavirus. Mana ndị dị otu amachaghị ihe na-ekwu. Nnyocha emeela ka o doo anya na ọ bụrụ na ebelata mmekọrịta ahụ mmadụ na ibe ya, mgbasa ọrịa na-efe efe dịka coronavirus ga-ebelatakwa. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Chukwunaeme Obiejesi https://www.bbc.com/igbo/afirika-52286922 +politics Enyinnaya Abaribe ekwuola ihe o merela kemgbe afọ 13 ọ malitere ịnọchite Abia-South "Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchiteanya Abia-South n'ụlọomeiwu Naịjirịa akọwaala ụfọdụ ihe ọ rụrụ kamgbe ọ banyere n'ọkwa Sịnetọ. Ọ sị na otu n'ime ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ o mere bụ iwepụta atụmatụ ịkwalite ihe ndị a rụpụtara n'Aba nke a kpọrọ 'Made in Aba'. Ọ sị na ihe mere o jiri malite nke a bụ maka na ""ọ na-aka mma isi n'ụlọ mara mma pụwa n'ama"". Abaribe sị na ụfọdụ ihe ndị ha kwadoro gụnyere ịrụpụta akpụkpọ ụkwụ, uwe ndị nchekwa gụnyere ndịagha, ndị uweojii, ndị Civil defence nakwa uwe ndị ji otu afọ efe ala nna ha.dgz. Ọ sị na ọ bụ maka mbọ a ha gbara mere gọọmentị Naịjirịa ji malite atụmatụ nke ha a kpọrọ 'Made in Nigeria'. Ihe ndị ọzọ Sịnetọ Abaribe sị ha mere gụnyere ịrụ okporoụzọ, ịgbape mmiri, ịrụ ọkụ latrik izụrụ ndị mmadụ ụgbọala na ọgbatumtum na ihe ndị ọzọ. Kirie ihe o kwuru n'uju Ndị mer akụkọ a bụ Chimamaka Ihenacho na Chiemela Peter Mgbeahuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-54143985 +health China Coronavirus: Mba China sị ka anyị ghara ikwu maka ọrịa a - Onye Naịjirịa nọ na China "Dịka ọrịa coronavirus na-abawanye na Chaịna nakwa mba ndị ọzọ, otu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ na mba ahụ emepeela mpio etu ọnọdụ ha nọ ebe ahụ si kwụrụ. Chukwunonye (anyị edeghị ezigbo aha ya maka etu ihe si kwụrụ) gwara BBC Igbo na ọnọdụ ha na Chaịna, bụ ebe ọ na-agụ mahadum, adịghị mma ma ncha. Chuwkunonye sị na ha anaghị esinwu ebe ha bi pụọ. ""Onye ọbụla nọ n'ọnọdụ Bekee kpọrọ 'Quarantine' ugbua. ""A na-achọ igbochi mmadụ ịpụ ga bute nje ahụ."" Gee ihe o kwuru n'uju." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51372241 +entertainment New Year's Day: Ihe ndị a ga-adị ndị a mụrụ bido n’afọ 2000 ka ‘film’ Ka a na-abanye afọ iri ọhụrụ nakwa agba ọhụrụ ọzọ, ọtụtụ ihe agbanweela nke bụ na ụfọdụ ndị a mụrụ n'otu oge agaghị amata ihe ha bụ. Ihe ndị ahụ bụ ihe ndị dịbu adị mana ụmụaka a mụrụ n'oge Bekee kpọrọ 'Generation Z' (site n'afọ 1999 ruo ugbua), amaghị ya dịka etu a ọ dịbu. Ha mazị ya ugbua site n'ụzọ ọgbara ọhụrụ e si rụgharịa ya, nke bụ na ihe ndị ahụ adịla mfe iji n'aka na-akpagharị ma ị chọọ. Lee ụfọdụ ihe ndị ga-agba ụmụaka 'Generation Z' gharịị: N'ihe karịrị afọ iri gara aga, a na-etinye ihe a kpọrọ 'kaseetị' n'ime igwe okwu na-enwekarị ma redio ma ihe na-akpọ ya bụ kaseetị, tupu ị gere egwu. Mana ugbua, e nweela ihe dị ka 'YouTube', Audio Mack, Spotify, Boom Play na ihe ndị bụ ebe ị ga-esi butuo egwu ọbụla masịrị gị, tinye ya n'ekwentị gị maka igere ya oge ọbụla ị chọrọ. Ọ bụrụkwanụ na ị chọghị ibutu ya ebutu, ị nwereike lere ya ka vidio n'elu ịntanetị mgbe ọbụla ị chọrọ. Ka ọ dị ugbua, ekwentị niile a na-arụpụta ugbua na-ebu redio n'ime ya; nke ọ ga-abụ ịkwụnye ihe ntị ya nke bekee kpọrọ 'earphone', ọ bụrụzịa gere gawa. Ọ bụrụ na ị ma mgbe a na-eji ekwentị a akpọ mmadụ, e kwesịrị ka a na-akpọ gị 'daa' maọbụ 'dee'. Makana ọ gafeela afọ iri abụọ (20) e wepụtara nke a na-ejizi n'aka nke bekee kpọrọ 'mobile phone'. Ndị ma ekwentị a ma ihe ha ji anya ha hụ gbasara ịkp��� mmadụ. Ọ pụtara na onye ahụ ga-anọgodu nso ya bụ ekwentị tupu ọ zaa ya. Mana ugbua, ọ bụghị naanị na ị ga-anọnwu ebe ọbụla zaa ekwentị gị ma mmadụ kpọọ gị, ị ga-ejinwu ekwentị gị nweta ozi maọbụ chọta ozi site n'ihe a kpọrọ 'ịntanetị'. N'agbanyeghi na ụfọdụ ka na-eji mma emepe komkom, e nwere ihe a rụpụtara iche a n-eji emepe ya. Ihe ahụ nke bekee kpọrọ 'tin cutter', bụ ihe a na-eji agba komkom okirikiri. Tupu afọ 2000 eruo, a na-eji nke ọ ga-abụ ị sụnye n'ime komkom ị were aka gị na-akụ n'elu ya, megide etu a wee gazuo okirikiri okwuchi komkom ahụ. Mana ugbua, egwu adagharịala makana ndị nke a na-arụpụta ugbua anaghị ata ndụ mmadụ ahụhụ. Akwụkwọ ozi ịhụnanya (Love letter): Ndị agba ọhụrụ a ka ma na a na-ede leta ugbua? Mgbe ochie bụ na ị ga-ede akwụkwọ ozi, nye mmadụ ka o nye onye i deere ya, maọbụ gaa n'ụlọorụ nzipu ozi a kpọrọ 'post office' ịga zipu ya. Mana ụbọchị agbanweela ugbua, kama ogologo usoro ahụ, ị ga-edenwuzi ihe bekee kpọrọ 'text message' n'elu ekwentị gị, zipu ya na-erughi otu nkeji, onye ahụ asakwaa gị ozugbo. Nke ugbua bụ na ị nwere ike zie onye ị chọrọ izi ozi, ihu na ihu site na nke a kpọrọ 'video call'. Owu e ji akpa isi: Ụmụaka ọgbara ọhụrụ nwereike ha ahụtubeghidị owu isi a anya mbụ makana a na-achọzị ya achọ n'ahịa. Mana oge ọ na-ewu, ihe a bụ ihe e ji eke isi dị iche iche, na-achọ mma n'ụzọ pụrụ iche. Akụkọ kwukwara na ọ na-enye aka ime ka ntutu mmadụ too ogologo. Ugbua, kama iji isi owu kee isi, e nweela nke a na-akpọ 'attachment', 'weaveon' nakwa ndị ọzọ dị iche iche a na-eji eke isi. 'Typewriter' Ọ bụrụ na ị ji taịpraịta gụọ akwụkwọ maọbụ rụọ ọrụ, ekelekwaa m gị oo! Kọmputa pụtara ụwa napụzịa taịpraịta ọrụ ọ na-arụ bụ iji ya ebi ihe n'akwụkwọ. Ugbua, kama ọ ga-abụ i jiri taịpraịta na-ede ihe ị gbaa mbọ hụ na i tinyere 'ịnk', na ị kwagharịkwara ya ma ị degide ruo n'isi dgz, ị ga-edenwuzi ihe niile ị chọrọ n'elu kọmputa gị, na-atụfughi ụra n'ebe ị ga-esi weta ịnk makana ọ gwụlahịri gị. Kọmputa emeela ya ka ọ dị mfe ide ihe na mpempe akwụkwọ. Kedụ ndị ọzọ ị ma? Akụkọ ndị a ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50941369 +health Covid-19: Ihe ala ili na-egosi maka coronavirus na Somalia Ndị dọkịnta abụọ na-azọ ndụ ha a Mogadishu bụ Isi Obodo Somalia ekwuola etu ha si alụso ọrịa coronavirus agha. Akụkọ kwu kwara maka nke bụ eziokwu na ọnụ ọgụgụ gọọmentị mba ahụ na-ewepụta maka ọrịa covid-19. https://www.bbc.com/igbo/afirika-53551244 +entertainment Obi Cubana and Abba Kyari at Wedding: Ihe ụmụ ụwa na-ekwu maka foto ha sere ọhụrụ a "Foto Obi Cubana na-eme azụmahịa nakwa Abba Kyari bụ onye uweojii Naịjiria sere ọhụrụ a etinyela ọtụtụ okwu n'ọnụ ndị mmadụ. Kyari tinyere foto ahụ na Facebook ya ma depụta na ọ gara agbamakwụkwọ Maina Alkali, nwa nwoke onyeisi ndị uweojii Naịjiria bụ Alkali Baba. Agbamakwụkwọ ahụ mere na ụlọ eze Shehu nke Borno, Abubakar El-Kanemi na Maiduguri bụ isi obodo Maiduguri n'ụbọchị Satọde. Gọvanọ Babagana Zulum nke steeti ahụ, nakwa Mai Mala Buni nke Yobe steeti nakwa Badaru Abubakar nke Jigawa steeti. Ndị ọzọ biakwara ya bụ agbamakwụkwọ gụnyere onyeisi sineti bụ Ahmad Lawan, gọvano chiburu Borno bụ Kashim Shettima, minista njem ụgbọelụ bụ Hadi Sirika, onye azụmahịa ama ama bụ Aliko Dangote nakwa ndị ọzọ. Cheta na ngalaba Nigeria Police Service Commission kwụsịtụrụ Kyari ọrụ na July 31st 2021 maka ebubo nrụrụaka ụlọọrụ Federal Bureau of Investigation nke mba Amerịka boro ya nakwa mmekọ ya na Ramon Abass, aka Hushpuppi, a na-enyo maka mpụ na nrụrụaka. Onyeisi uweojii Naịjiria bụ Usman Alkali Baba gwara ngalaba PSC ka ha kwụsitụ Kyari ọrụ ruo mgbe ha ga-emecha nyocha maka ebubo ngalaba Federal Bureau of Investigation nke mba Amerịka wepụtara maka Kyari. Otu ihe kachasi mee ndị mmadụ ji akatọ Kyari bụ maka mmekọ ya na ụfọdụ ndị mmadụ ama ama dịka Obi Cubana. Abba Kyari dị afọ iri anọ na isii bụ onye Borno steeti dị na mpaghara ugwu Naịjirịa. Ọ nwetere asambodo Geography na mahadum nke o ji nwete ọrụ dịka Assistant Superintendent ndị uweojii n'afọ 2000 dịka ọ natachara ọzụzụ na police academy dị na Wudil, Kano steeti. Ọ bụ mgbe ọ dụgara ndị otu ya nwudere onye ori akpọrọ Ndagi a.k.a spirit a na-achọ achọ kamgbe ka Kyari bidoro wube ebe niile. Ndagi weghara ọchịchị Numan bụ obodo kachasi n'Adamawa dị na mpaghara ugwu Naịjirịa. N'afọ 2005, ka ọ banyere ndị uweojii Mobile Police Force ebe ọ banyere ụlọọrụ ndị uweojii Legọs n'afọ 2010. Kyari mechara bụrụ mmadụ nke abụọ n'ụlọrụ uweojii nakwa onyeisi Special Anti-Robbery Squad (SARS), ngalaba uweojii na-ebuso mpụ agha. Obi Cubana nke ezigbo aha bụ Obinna Iyiegbu, bụ onye oji ego achụ ego a na-anụ aha ya n'ihe gbasara ịgba oringo na Naịjiria, dịka ọ bụ onye nwere ọtụtụ ebe oriri na nkwari. Obi a na-etu ""Okpole Yankee"" na-aza Obi Cubana n'ihi aha otu ụlọ oriri na nkwari ya bụ Cubana. N'agbanyeghi na ọ gụrụ maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mahadum University of Nigeria Nsukka (UNN), ọ gwara BBC Igbo na o nweghi mmasị ịzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ugbua ma n'ọdịnihu. Ọ bụ onye Oba, dị n'okpuru ọchịchị Idemili, n'Anambra steeti. A mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Epreelụ, 1975. Ya na Ebere nwunye ya ji ụmụ nwoke anọ. Akwamozu nne ya wuru ewu na soshal midia n'afọ 2021. N'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba afọ 2021, ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka na Naịjiria bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), kpọtara maka ịgba ya ajụjụọnụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60187416 +business Lejja Town: Ị ma na a na-akpụ ụzụ n'ala a n'afọ 4000 gara aga? "Obodo Lejja bụ ebe ọtụtụ mmadụ amaghị na a na-akpụ ụzụ n'oge gboo. Mana onye ọkammụta n'ihe gbasara ""Archeology"" maọbụ igwuputa ihe ndị dị n'ala, kọwara etu e si chọpụta ebe a. Lee ihe onyonyo a ka ị hụ ihe ndị tụrụ n'anya si n'obodo a were pụta. Ndị mere ihe onyonyoa a bụ Chiemela Peters na Ikechukwu Kalu Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/media-52918197 +health Healthy living: Ka ị ga-esi gbanahụ 'ọdịda n'ike' na-ebute ọnwụ.' Dika a na-enweta akụkọ ndị mmadụ na-anọkata daa nwụrụ, ọ na-agbagọjụ ụfọdụ anya etu dimkpa maọbụ agada agada nwaanyị ga-esi nọkata daa ma nwụrụ. Dibia bekee bụ Chidimma kwuru ihe ole na ole nwereike ịkpata ya bụ ọdachị nakwa ogbugbo ya. Ihe ụfọdụ ụzọ ndị ahụ dọkịta Chidimma kpọpụtara. 1.Oke ndọli: O kwuru na nsogbu a na-emekarị n'etiti ndị ọgbara ọhụrụ a na-adọlị n'ime oke ahụhụ ịkpata ihe ọnụ ga-eri. Ogbugbo: Nwete ezumike zuruoke. 2. Oke ọbara mgbalielu: Ogbugbo: Na-anwụ ọgwụ ga-ebutedata ya nke dọkịta gị ji aka ya nye gị. 3. Oke ọbara mgbatu ala: Ọgbugbo: Lele ahụ gị n'ime ọnwa isii ọbụla ka ịchọpụta nke a ma nata ndụmọdụ zuruoke n'aka dọkịnta gị 4.Afo ime: Dọkịta Chidimma kwuru na ndị ime nwereike ịda mgbe ọbụla. Ogbugbo: Nata dọkịta gị ndụmọdụ ma ịchọpụta na ị na-adakarị ma ị dị ime. 5.Anwụghị mmiri: Nke a pụtara na onye ahụ anaghị aṅụ mmiri ọfụma. Ogbugbo: Dọkịnta Chidimma kwuru na ọ ga-adịmma ka mmadụ na-agba mbọ hụ na ọ na-aṅụ mmiri ugboro gboro n'ụbọchị 6. Oke egwu Ogbugbo: Ihe hija gị n'ike ,jide obi aka. 7. Oke ụfụ Ogbugbo: Nabata ọgwụ dọkịta gị nyere gị maka nke a 8. Etu isi ekulite n'ụra: Dọkịta Chidmma kwuru na etu mmadụ si ekulite n'ụra nwerike ịkwatụ ya n'ike maọbụrụ na omeghị ya ọfụma. Ogbugbo: Ikulite n'ụra, tụgharịa n'akụkụ gị nọrọ oge tịnkọm tịnkọm, nọrọala oge tịnkọm tịnkọm, chituo ụkwụ gị n'ala oge tinkọm tịnkọm ma rituo n'oge na-adịghị anya n'elu akwa. N'ikpeazụ dọkịnta Chidimma kwuru na ọ ga-adị mma ka mmadụ na-ewepụta oge na-aga na-enyocha ahụ ya opekatampe otu ụbọchị n'ime ọnwa isii. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50138262 +business Price of fuel: 'Gọọmenti nye anyị obere oge ka anyị rechaa nke anyị nwere enwe' - IPMAN Enugwu. Na agbanyeghị iwu ọhụrụ gọọmenti etiti nyere ka e wetuo ọnụahịa mmanụ ụgbọala, ndị na-ere mmanụ n'Enugwu ka kwụ ebe ha kwụ. BBC gagharịrị n'ọtụtụ ọdọ mmanụ dị n'Enugwu ụtụtụ Tọzde were hụ na ha ka na-ere mmanụ n'ọnụ ₦145. Naanị ọdọ mmanụ NNPC Mega Station dị n'Enugwu bụ ndị na-erezị ₦125. Ndị otu na-ere mmanụ ụgbọala n'Enugwu bụ IPMAN ayọọla gọmenti ka onyetụ ha obere oge ka ha wee rechaa mmadụ ha buteburu oge gara aga n'ihi na ha zụrụ ya oke ọnụ. Onye isi IPMAN Enugwu bụ Mazi Chinedu Anyaso kwuru na ya bụ ntụziaka gọmenti bìara na mberede nke mere na ọtụtụ ndị ọtụ ha eruwabeghị isi na ya bụ iwu. Anyaso kwuru na gọmenti kwesịrị inyekwu ha obere oge tupu amalite ya bụ iwetu ego n'ihi na ọtụtụ n'ime ha bụ ego ebitere ebite ka ha ji azụ ahịa mmanụ. Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51963957 +politics Anambra Impeachment: Akwụsịla mmadụ atọ ọrụ n'ike Akụkọ dị mkpa taa Ọka na-ekpo ọkụ ugbua. Akụkọ si Ọka kwuru na ọgbaghara dara n'ụlọomeiwu Anambra steeti nke mere ndị uweojii jiri gbochie ụzọ esi aba n'ime ya. Anya hụrụ ihe mere sị anwụr�� anya mmiri chusara ndị mmadu na gburuguru Obi Gọọmenti n'Ọka. N'akụkọ metụtara nke a, onyeisi otu APGA n'Anambara steeti bụ Chief Norbert Obi akwụsịla mmadụ atọ ọrụ n'ike maka nkata akpara iji chụtuo onyeisi ụlọomeiwu Anambara. Ndị a kpọrọ aha ha maka ihe a bụ Ikem Uzoezie, Harford Osekke nakwa Victor Okoye. Onyeotu pati APGA achọghị ka-akpọpụta aha ya gwara BBC Igbo n'ekwentị na-akwụsịrị mmadụ atọ a ọrụ n'ike n'ezie. N'ofesi Onye ọkaiwu gọọmentị Saudi Arabia ekwuputala na ha na-atụ mmadụ iri na otu aka maka ọnwụ Jahmal Khasoggi. O kwuru na ọ bụ osote onyeisi uweojii nzụzọ nyere iwu ka kpulata Khasoggi Saudi Arabia, ma kwukwa na aka ọkparaeze Mohammed bin Salmman adịghị n'ọnwụ ahụ. N'egwuregwu Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ bụ FIFA ezigarala ogbo ha nke Naịjirịa ozi itiakanobi maka ọnwụ Ajuma Otache. Otache bụbụ osote onye nkuzi otu ụmụnwaanyị Naịjirịa nke pụrụiche tupu ọ nwụọ. Gee Nkeji nke mgbede a Ihe onyonyo nke taa A mịpụla ego ọzọ n'akpa NLNG - Sineti Ụlọomeiwu ukwu bụ Sineti ekwuola na ha achọpụtala ego dị otu ijeri dọla ndị ụlọọrụ NNPC mịpụrụ site n'akpaego ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ gaasị bụ NLNG. Onyeisi kọmitee mere nyocha ahụ bụ Bassey Albert Akpan agwala ndị NNPC na CBN ka ha gosi akwụkwọ eji mịpụ ego ahụ. Ndị gọvanọ Naịjirịa ekwuola na ha agaghị akwụlị puku naịra iri atọ dịka ụgwọ opekatampe ọhụrụ ma ọ bụghị ya na ha ga-achụlata ụfọdụ ndị ọrụ n'ọrụ ha. Gọvanọ Abdulaziz Yari nke Zamfara bụ onyeisi ndị gọvanọ kwuru na ha ga-aga hụ onyeisiala Buhari ka a achọọ ụzọ ọzọ a ga-esi gboo nsogbu a. Osote onye ndụmọdụ na nchekwa na 'White House' bụ Mira Ricardel ahapụla ọrụ n'ihi nsogbu dị n'etiti ya na nwunye onyeisiala bụ Melania Trump. Cheta nwunye Trump gwara Ricardel na onwezighi ugwu ịrụ ọrụ na 'White House'. Ndị Super Falcons nke Naịjirịa awụchiela na Ghana maka asọmpi Iko mba Afrịka ụmụnwaanyị ga-amalite na Satọde abalị iri na asaa nke ọnwa Nọvemba. Nke a bụ agba nke iri na otu asọmpi a, bụ nke ha mabuterela ugboro asatọ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-46218837 +politics Anambra Election: Ihe mere ụfọdụ mmadụ anabataghị ntuliaka ime ụlọ PDP na APC n'Anambara "Nghọtahie ka na-arị ibe ya elu na pati 'Peoples Democratic Party"" (PDP) nakwa ""All Progressives Congress"" (APC) gbasara ntuliaka imeụlọ ha mere n'ụbọchị Satọde. Na PDP, ha kewara abụọ ma nwee mmadụ abụọ na-ekwu na ọ ha meriri ya bụ ntuliaka, aha ha bụ Valentine Ozigbo na Ugochukwu Uba. N'aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị APC na-ekwu na enweghị ntuliaka ọbụla mere na steeti ahụ. Peter Obi, Alex Obiogbolu ekeleela Valentine Ozigbo nke PDP Aka chịburu AnamAbra steeti bụ Peter Obi ekeleela Valentine Ozigbo maka nturuugo ya na ntuliaka imeụlọ ahụ. Peter Obi kelere ndị isi PDP n'Abuja maka etu ha si mee ntuliaka ahụ na-enweghị onye ọbụla ha dọnyeere ukwu. Obi rịọrọ ndị ọzọ so zọọ ndọrọndọrọ ahụ ka ha wetuo obi ma kwadoo Valentine Ozigbo ka udo wee chịa. N'aka nke ọzọ, Obiogbolu, onye sorola zọọ ọkwa Gọvanọ ugboro anọ na pati PDP, kwuru na ọ bụ Valentine Ozigbo ga-efe ọkọlọtọ PDP na ntuliaka ọkwa gọvanọ na-abịa n'Anambra steeti. O kwuru sị: ""Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ were iwe ga mee ntuliaka nke ha, mana ọ pụtaghị na PDP kere abụọ."" ""Ntuliaka nke ndị INEC bịara nyochaa bụ nke anyị mere n'ogige 'women centre' dị n'Awka."" ""Onye meriri ya bụ ntuliaka bụ Valentine Ozugbo, ọ bụ ya ga-anọchite PDP n'Anambra steeti. ""Onweghị ezinụlọ anaghị enwe esemokwu, kama ihe dị mkpa bụ e sechaa okwu, edozie."" ""PDP amalitela atụmatụ iji kpọghachi ndị niile iwe na-ewe, iji mee ka anyị turu ugo na ntuliaka nke Nọvemba 6."" A bịa na pati APC, ndị pati ahụ ekwuola na ọ bụ Andy Uba meriri ntuliaka imeụlọ ha. Mana ọtụtụ ndị welitere isi na pati ahụ kwuru na ntuliaka ahụ enweghị isi. Chris Ngige, aka chịburu Anambra steeti ma bụrụkwa onye APC kwuru na enweghị ntuliaka ọbụla e mere n'obodo ya bụ Alor. Ngige kwuru na ọ ka mma ka etinyegharịa ụbọchị ọzọ a ga-eme ya bụ ntuliaka. Ọzọ dịkwa ka ibe ya, mmadụ iri na otu n'ime mmadụ iri na anọ soro zọọ ọkwa gọvanọ na pati APC ekwuola na ha anabataghị mpụtara ntuliaka ahụ. Ha kwukwara na ha anabataghị Andy Uba dịka onye meriri ya bụ ntuliaka n'ihi na ewneghị ntuliaka ọbụla e mere. Ndị kwuru nke a gụnyere: George Moghalu, Paul Orajiaka, Edozie Madu, Johnbosco Onunkwo, Ben Etiaba, Amobi Nwaokafor, Chidozie Nwankwo, Geoffrey Onyejegbu, na Azuka Okwuosa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57636770 +sports Man United vs Arsenal: Arsenal ekweghi Man United ṅụrụ mmiri tọgbọ iko O nweghi onye tụrụ azụ ibe ya n'ala n'etiti Manchester United na Arsenal dịka ha zutere n'asọmpi Premier League. Asọmpi a dị n'etiti otu egwuregwu abụọ ndị a bụ ọgụ dimkpa abụọ maara onwe ha nke ọma. Nke a mere o ji raa ha ahụ inye ibe ha goolu rue na ngwụcha ọkara nke mbụ. Na nkeji 45, Man United bu ụzọ tụọ Arsenal azụ n'ala site na goolu Scott McTominay nyere. Dịka ọkara nke abụọ malitere na nkeji 58, Arsenal siri ọnwụ ma megwara Man United mgbe Pierre-Emerick Aubameyang nyere goolu. Dike abụọ ndị a sisara onwe ha ọnwụ niile ha nwereike mana o nweghi onye nyere ibe ya goolu ọzọ. Mpụtara asọmpi mere ka Man United nọrọ na ndị iri ebe Arsenal bụ ndị anọ n'ogogo tebụlụ Premier league. Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49883579 +entertainment Ric Hassani ezi aha ya bụ Ikechukwu Ahiauzu ọ bụ onye? "Foto otiegwu a ma ama bụ Waje na otiegwu Ric Hassani ebe ha na-eme 'love nwantịntị' pụtara na soshal midia emeela ka ụmụ Naịjirịa kwuwe na ha na-achọ ịlụ di na nwunye. Waje wepụtara foto a n'akara instagram ya ma tinye eserese ihunanya n'akụkụ ya. Nke a mere ka ndị mmadụ ma ndị ọyị ha bido butewere ha ozi ekele ha deme n'ihunanya dabara ha. Waje dị afọ iri anọ ji a mụọla nwada dị afọ iri abụọ na otu a kpọrọ Emerald, ebe Ric Hassani dị afị iri atọ na abụọ amụtabeghị nwa. Waje dekwara n'akụku foto ahụ o wepụtara sị na ""oge eruola"" mana ndị mmadụ ka na-ajụ oge ihe ole ruru. A mabeghị nke ọ bụ, ma na ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na o nwereike ịbụ egwu ka ha na-akwado itiputekọ ọnụ. Mana mgbe BBC kpọtụrụ ndị otu Waje, ha kwuru na o nwere nnukwu nkwupute ha na-akwado ime. N'okwu Waje, ""agaghị m ekwupute ya ugbua, mana obi dị m ụtọ nke ukwu"" O meghị ka o nwere ihe merenụ. Ọ depụtere na twitter ya na ọtụtụ mmadụ amarala na striti ya, ""nna ọgịnị na-eme?""ka onyonyo ebe na-akwa iko agbaala n'anwụ, biko gịnị na-eme n'ụtụtụ a?"" Onye bụ Ric Hassani? Ikechukwu Eric Ahiauzu e ji Ric Hassani wee mara abụghị anụ taa. N'afọ 2017 ka ọ chakere site n'egwu dịka 'Gentleman' , 'Believe', 'Number One' na 'Marry You' nke o tipụtara. Ya na otiegwu dịka Falz, Olamide, Chike and Johnny Drille etikọọla egwu. E ji iti egwu ihụnanya mara ya. N'afọ 2019 ka ọ wepụtara egwu ""Do like i say"" nke ya ndị otu egwu ya akpọrọ DBYZ tiputere." https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-55695819 +politics Rochas Okorocha na EFCC: Ụlọikpe ajụla ịtọhapụ Rochas Okorocha dịka EFCC kpụpụrụ ya ikpe taa "Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja ajụla ịtọhapụ aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha n'ikpe metụtara mmefu ego dị ijeri N2.9. Ngalaba gọọmentị na-ebu agha megide nrụrụraka bụ 'Economic and Financial Crime Commision' (EFCC) kpụpụrụ Okorocha n'ụlọikpe n'ụtụtụ taa bụ Monde maka ebubo 17 metụtara nrụrụaka. Dịka a kpọpụtara ebubo ndị a ahụ n'ikpe ahụ nke Jọstis Inyang Ekwo nọ n'isi ya, Okorocha kwuru sị na aka ya dị ọcha. Ọkaikpe Ekwo higharịrị ikpe ahụ gaa echi bụ Tuzde, abalị 30 nke ọnwa Mee, afọ 2022, bu ụbịchi a ga-etinye ọnụị n'okwu ma a ga-enye Okorocha ohere isi n'ụlọ abịa ikpe ahụ nke Bekee kpọrọ bail. Ọkaiwu ahụ nyere ntụziaka ka e jichie Okorocha ganye ụbọchị ahụ. Cheta na n'ịzụụka gara aga,abalị 24 nke ọnwa Mee afọ 2022, ndị ọrụ EFCC nwuchiri Okorocha n'ụlọ ya dịka ha kwatara ọtụtụ awa, ma kpakaa ụzọ nakwa elu ụloOkorocha na Maitama, dị n Abuja. Akụkọ ka na-abịa Ngalaba gọọmentị na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka na Naịjriịa bụ 'Economic and Financial Crimes Commission' (EFCC) akọwala ihe mere ha ji nwụchi Sinetọ Rochas Okorocha n'ụlọ ya ụbọchị Tuzde. EFCC nwụchiri Okorocha dịka ha chị ndị uweojii gbara egbe aghara aghara, gbaka ụzọ na elu ụlọ tupu ha banye n'ụlọ ya dị na Maitama Abụja n'abalị 24 nke ọnwa Mee afọ 2022. N'ihe onyonyo nke Okorocha tinyere n'akara Facebook ya n'abalị Tuzde gosiri ebe ọ mara afọ n'ala na-ekpe ekpere ka Chineke gbatara ya ọsọ enyemaka dịka ndị ọrụ EFCC na-agbawa ụzọ nakwa elu ụlọ ya. Nwa Okorocha kwuru n'ihe onyonyo ahụ a nataghị ikike nnwụchi n'ụlọikpe iji nwụchi ya. Mana n'ozi ha wepụtara n'akara Instagram n'ụtụtụ Wenezde, ha kwuru na ihe mere ha ji gawa nwuchie ya n'ụlọ ya bụ na ọ jụrụ ịza oku ha. ""Nke a so ọjụjụ ọjụjụ onye bụbu gọvanọ ịza oku a kpọrọ ya ugboro ugboro"" dịka EFCC hapụburu ya ka o si n'ụlọ na-abịa nke Bekee kpọrọ ""Adminstrative bail"". EFCC kwuru na ha kpụburu Okorocha ụlọikpe n'abalị 24 nke ọnwa Januwarị afọ 2022 maka ebubo metụtara imefu ego ọha na ala ruru ijeri naira abụọ na ụma itoolu (N2.9 million). Ha kwuru na Okorocha ekweghị ka e nye ya akwụkwọ ịkpọ oku n'ụlọikpe ikpe ahụ nke Jọstis Inyang Ekwo nke Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị'Abuja nọ n'isi ya. Nke mere ka e yigharịa ikpe ahụ gaa abalị 28 nke Maachị. ""Jọstis Ekwo higharịrị ya gaa Mee 30 ma dọọ aka na ntị na ""nke a ga-abụ ikpeazụ m ga-ehigharị ya."" Ha kwuru na ọ bụ nke mere na EFCC ""enweghịzị ihe ọzọ anyị ga-eme karịa ịnwụchi ya kpụta ya maka ikpe ya ikpe."" Ụlọọrụ na-ahụ maka igbochi mpụ na nrụrụaka na Naịjriịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) anwụchịela Sinetọ Rochas Okorocha n'ụlọ ya. EFCC wakporo ụlọ Okorocha ka a nụchara ụda egbe n'ogige ụlọ ya. Otu onye nọ nso ezinụlọ ahụ ihe a mee na-achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ""A gbara ọtụtụ gaasị mmiri anya n'ime ụlọ Okorocha dịka ha nwara ịchụpụ ndị niile nọ ebe ahụ."" Onye ahụ kwuru na Okorocha kwanyere ndị ahụ ugwu dịka ha malitere iji aka ike eso ndị mmadụ ebe ahụ. EFCC kwusiri ike na ndị ntaakụkọ niile nọ ebe ahụ ga-apụrịrị n'ịlọ ahụ, dịka ha chụpụrụ ndị niile nọ n'ụlọ ahụ n'ike. Akụkọ kwuru na e mekpara ụfọdụ ndị ntaakụkọ nọ ebe ahụ ahụ dịka ezuru ụfọdụ n'ime ha egbe n'ahụ. Ihe onyonyo Okorocha zipụtara n'akara Facebook ya gosiri etu ndị nchekwa nke EFCC siri wakpoo be ya, gbawaa elu ụlọ be ya dịka ha gbara isi akwara ịnwụchịe ya. Cheta na akụkọ pụtara na mgbede ụbọchị Tuzde na aka chiburu Imo Steetị bụ Rochas Okorocha etiela mkpu na ndị ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ EFCC wakporo ụlọ ya dị n'Abuja. EFCC wakporo ụlọ ya dị na mpaghara Maitama Abuja n'ehihie Tuzde dịka na na-achọ ịnwuchi ya. Mgbe Okorocha na-aza ekwentị ndị Channels TV kpọrọ ya, ọ katọrọ agwa ndị ngalaba EFCC kpara ma ṅụọ iyi ịnọgide n'ime ụlọ ruo mgbe ọ ga-ahụ akwụkwọ ikike sị ka a nwụchie ya. N'okwu ya ""e ji m n'agbụ ebe a, ajụọla m ha ma ha ji akwụkwọ ikike ịnwụchi m. Ana m akwado ịga mee nyocha maka ọkwa onyeisiala m na-azọ"". ""Amaghị m ihe na-eme; Ọ bụ ihe ọjọọ na ihe a na-eme ebe a. Aga m anọ ebe a ruo mgbe m matara ihe ha na-achọ, a chọrọ m ịhụ akwụkwọ ikike sịrị ha nwuchie m"". Ihe onyonyo si n'ụlọ Okorocha bụ nke dị na soshal midia gosiri ebe ndị EFCC juru na mbara ezi ụlọ Okorocha. Ha siri ọnwụ ka Okorocha nyefee ha onwe ya maọbụ zaa oku ha kpọrọ ya kamgbe bụ nke ọ na-achọghị ịza. Ndị EFCC jiri ihe dochie ọnụ ụlọ Okorocha nke gbochiri ụfọdụ ndị ntaakụkọ ịbata na ndị ọzọ ịbata n'ime ụlọ ya. Ha mechara sị na chọrọ ịgbaka ọnụzọ ụlọ Rochas ebe ọ jụrụ ịpụta ka ha nwuchie ya. EFCC dere na ọbaozi webaịtị ha sị na Rochas gbapụrụ ọsọ, jụ ịza oku ụlọikpe kpọrọ maka ikpe ya n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Maachị. Ha sị na ọkaikpe ya bụ ikpe dị n'aka bụ Justice Ekwo bụgharịi ya bụ ikpe ruo ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee, ma dọọ aka na ntị na nke ahụ bụ nke ikpeazụ ọ ga-ebugharị ya bụ ikpe. Ha sị na ọ bụ ya mere ha jiri bịa ịnwụrụ ya. Ihe onye nọ ezinụlọ Okorocha nso gwara BBC Igbo maka nwụchị ya Akwụkwọ onye ahụ nọ nso ezinụlọ Okorocha zitere BBC Igbo gosiri ihe ọ sị bụ mkpebi ụlọikpe mere n'isi nwụchị Okoroche nke EFCC mere n'afọ 2021. Mkpebi ụlọikpe ukwu dị na Pọta kọtụ nke ọkaikpe Dalyop Pam nọ n'isi ya nọ n'ụbọchị isii nke ọnwa Disemba 2021 kwuru na etu ndị EFCC siri bịa kpụrụ, kpọchịe ma na-eyi Okorocha egwu ịbịa kpọchiị ya ọzọ maka inyocha ọchịchị ya n'Imo steeti site n'afọ 2011 ruo 2019 ezighị ezi. Ọkaikpe Pam kwuru na nke megidere iwu ikike diri onye nke ala Naịjirịa nakwa nke Afrịka. Akụkọ banyere ụlọọrụ EFCC na Rochas Okorocha malitere mgbe ọ rituru n'ọkwa dịka gọvanọ Imo Steetị n'afọ 2019. Ha boro ya ebubo izu ego gọọmentị Imo Steetị mgbe ọ nọ n'ọchịchị ma kpachie ọtụtụ ụlọ Rochas ne ezinaụlọ nwe. N'ọnwa Jenụwarị afọ 2022, ụlọọrụ EFCC boro Okorocha ebubo ọhụrụ ruru iri na asaa nke ọnụego ya bụ ijeri naịra abụọ na ụma (N2.9bn) ma kpụpụ ya n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja. Ha sị na Rochas na ndị ọzọ gụnyere onye pati APC bụ Anyim Nyerere Chinenye, ụlọọrụ ise gbakọtara aka ma zuo ego ọha. Ụlọorụ ndị a bụ Naphtali International Limited, Perfect Finish Multi Projects Limited, Consolid Projects Consulting Limited, Pramif International Limited, na Legend World Concepts Limited. Ha sị na ego a ha zuru megidere iwu na-achị mbupu na ịtụmgbere ego na Naịjirịa nke afọ 2011 (Money Laundering Act 2011). EFCC wepụtara ebubo ọhụrụ ngwa ngwa Rochas kwupụtachara mmasị ya ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61569129 +health Covid-19 n'otu nkeji: 'Mask' a ga-egbochi gị ibute ọrịa Coronavirus? Dịka ndị mmadụ na-ekpuchi imi na ọnụ ha iji gbochie ibute ọrịa Coronavirus, ụfọdụ na-ajụ kedu nke bụ eziokwu https://www.bbc.com/igbo/afirika-52040815 +politics "Nnewi South LGA Attack: ""Anyị agaghị ekwe ka ndị ekperima na-adọghachiri anyị aka elekere azụ"" - Soludo" "Aka na-achị Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo agaala njem nleta n'isi ụlọọrụ Nnewi South ebe ahụ ndị ekperima wakporo n'abalị Wenezde, Maachị 30, ma gbaa ya ọkụ. Soludo kwuru na ihe dị otu a bụ arụ kwọ nwa n'azụ, ""ọ bụghịkwanụ ihe e ji mara anyị."" ""Ndị Anambra agaghị ekwe ka ndị ekperima olemole na-adọghachiri anyị aka elekere azụ,"" Soludo kwuru. ""Anyị ejiri otu obi kwekọrịta na anyị ga-eme ka udo na ndokwa chịa n'ala anyị, onweghị ụdị mbibi ọbụla nwere ike ịkwụsị anyị."" Soludo gara n'ihu kwuo sị: ""Oge m na-ele anya n'ụlọ na ihe ndị ọzọ lara n'iyi na mbibi a, ajụjụ m jụrụ onwe m bụ,""onye ka ọghọm dịịrị?"" ""Ego a gaara iji rụọ ọrụ ma wulite ndụ ndị nkịtị na-akwụ ụtụ isi ha n'obodo, ya ka a ga-eji ugbua doziwe ụlọ na ihe niile ndị a e mebiri."" ""Enweghị ka anyị ga-esi gaa n'ihu n'ụzọ dị otu a."" Ndị omekome bu egbe agbalal isiụlọrụ Okpuruọchịchị Nnewi-South dị n'Ụkpọ, Anambara steeti ọkụ ma gbuo onye nche nọ ọrụ n'ogige ụlọọrụ ahụ n'ụzọ ụtụtụ Tọzde. Ụkpọ bụ obodo Mbazulikie Amaechi, okenye Igbo nwere agba bụbụ Minista njem ụgbọelu n'oge ọchịchị Shehu Shagari ma bụrụkwa onye du ndị Igbo ndị ọzọ wee agba gaa Abuja ịrịọ onyeisisala Muhammadu Buhari arịrịọ ka a tọhapụ onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu na mkpọrọ DSS e tinyere ya kemgbe ọnwa Juun afọ 2021 a nwuchiri ya na mba Kenya. Onye nọ nso ebe ihe mere kwuru na ndị bu egbe a maghị ndị ha bụ wakporo ogige ụlọọrụ ahụ n'ụzọ ụtụtụ Tọzde, Onyeisioche Okpuru Ọchịchị Nnewi-South bụ Hon. Chieloka Okoye gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere n'ebe Elekere 12.30 nke isi ụtụtụ Tozde. Okoye kwuru n'ezie na ""ọ bụ ndị bu egbe a maghị ndị ha bụ"" (unknown gunmen). O kwuru na ndị nọ nso gara ịgbanyụ oku chee na ọ bụ ọkụ nkịtị mana ka ha rutere, ha hụrụ ọgbatumtum e dọtachara, dịka ha na-echezi etu ndị dọsara na gburugburu ebe ahụ. Ndị ahụ malitere gbawa ha egbe ha were mata na ọ bụ ha sunyere ọkụ ahụ. O kwuru na ndị omekome ahụ gbagburu otu onye nche nọ ọrụ n'ụlọọrụ ahụ. Mbọ BBC Igbo gbara ịnata ozi ndị uweojii Anambara steeti amịtaghị mkpụrụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara steeti bụ Tochulwu Ikenga asaghị okwu ka a kpọrọ ya n'ekwentị, nke ọ na-asa ozi e zigara ya n'igwe okwu 'Whatsapp' dịka a na-ewepụta akụkọ a. yo ya oge Ọdachi na-abịa babalị ole na ole gọvanọ ọhụrụ Anambara steeti kpọrọ otu Ipob oku ka ha dajụụ ma kwado mmepe obodo na steeti ahụ ma kwe nkwa inye aka maka ntọhapụ onye ndu ha bụ nnamdi Kanu. Kemgbe Januwarị afọ 2021, tigbuo-zogbuo gunyere izunye ụlọ ọkụ, oke ogbugbu ndị mmadụ gụnyere ndị ọrụ nchekwa, ọkachasị ndị uweojii na ndị andị Igbo nwere agba na-arị elu n'Ọwụwa Anyanwụ. Ndị uweojii Naijiria na -ekwu aka na ọbụ otu nnwereonwe Biafra a kpọrọ Ipob na alaka ọgụ ha bụ ESN bụ ndị na-akpa mkpamkpa ndịa mana otu Iponb agọola ugboro ugboro na aka ha dị ọcha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60942322 +entertainment Paul Okoye: Anyị toro n'ihe isi ike Paul Okoye, otu ejima nke P-Square kọrọ BBC ụdị ndụ ha biri mgbe ha na-etolite. Dịka o siri kọwa, a mụnyeghị ha n'efere nkụwa. https://www.bbc.com/igbo/media-43198958 +politics Inec Server: 'Anyị achịkọtala ọnụọgụgụ 'card reader' niile otu ebe na kọmputa' "Onyeozi Inec bụ Festus Okoye ka an-ekwusi ike na ndị ụlọọrụ ahụ enweghị ""Server"" bụ nke nyere ha ohere izipụ mpụtara ntuliaka 2019. Okoye si na iwu Naịjirịa enyeghị ha ohere ime otu ahụ. N'olu ya, ""iwu Naịjrịa nyere ikike iburu mpụtara ntuliaka niile nke dị na ""fọm̀ EC8A"" n'aka buga ebe a ga-egbokọba ha na wọdụ."" ""Iwu Naịjirịa anyị ji mee ya bụ ntuliaka amaghị iji igwe kọmpụta zipu ozi ọbụla."" Ndị 'Collation Officer' ka ọ bụ ọrụ ha iburu akwụkwọ ndị a n'aka buga ebe a chọrọ ya. ""O nweghị mgbe anyị jiri igwe kọmpụta zipụ mpụtara ntuliaka."" Okoye kwetara na ndị debere aha ha n'akwụkwọ maka ntuliaka 2019 niile dị na igwe kọmputa, na enyere ndị otu pati niile aha ndị a. O kwusiri ike na ""ọ bụ naanị mgbe eji igwe kọmuta tụọ vootu ka a ga-asi na ihe dị na sava"". Ọ sị na ya amaghị maka mpụtara ntulika 2019 ị dị na sava ọbụla. N'otu aka ahụ BBC jụkwara onye ọrụ kọmpụta ama ama bụ Emeka Unachukwu gịnị bụ 'server'? Unachukwu sị na ""'Server' bụ kọmpụta na-ejikọ kọmpụta ndị ọzọ ọnụ eji edewe mkpụrụozi dị iche iche"". O kwuru na Inec nwere ike ikwu na ha enweghị 'server' maka na o nwere ụlọọrụ ọzọ na e jidere ha mkpụrụozi mana ọ bụghị eziokwu na ha enweghị server' ebe e nwere mkpụrụozi. Ọ sị na Intanet nwere 'server' nke ya ebe ọtụtụ mmadụ na-edowe ozi ha. Unachukwu sị na ""Inec agaghị asị na ha enweghị sava maka na ha nwere ebe ha na edowe mkpụrụozi bụ data. Ha nwere ike kpọ nke a ""data base"" mana ihe ọ bụ bụ sava maka na kọmpụta ahụ jikoro ndị ọzọ ọnụ bụ ndị nke nwere ike ịdọro ọzi maọbụ zite ọzi na ya"". Ọ sị na ọhịara ahụ Inec isi na ha enweghị server'. Unachukwu kwuru na ọ bụrụgodi na a tụrụ vootu n'aka buru ya n'aka buga ebe a gụrụ ya, na Inec ga-etinyekwa ya na ya bụ 'server'. Mana ha nwere ike ikwu na ha etinyebeghị mpụtara 2019 na ya bụ 'server' nke gosiri na ha arụchabeghị ọrụ ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-48634017 +health "International Nurses Day: ""Ndị nọọsụ na-akọ asịrị nnukwu"" na ihe ndị ọzọ ndị Naịjirịa ji echeta ha taa" "Ụbọchị 12 nke ọnwa Mee bụ ụbọchị e wepụtara maka icheta ndị nọọsụ n'ụwa niile. Ndị nọọsụ na-agba mbọ n'inyere ndị dọkịta aka n'ihe gbasara ilekọta ahụike ndị e tinyere ha n'aka. Mana kedụ etu ndị Naịjirịa si ahụta ndị nọọsụ na-arụ ọrụ na Naịjirịa? BBC Igbo jụrụ ajụjụ a na soshal midia Facebook na Instagram, ụfọdụ kwadoro ọrụ ọma ha na-arụ, ebe ndị ọzọ kwuru na ụfọdụ n'ime ha anaghị arụ ọrụ etu ndị nọọsụ kwesịrị isi arụ. Ụfọdụ ihe ha kwuru gụnyere ""Ndị nọọsụ na-akọ asịrị"", ""ndị nọọsụ enweghi ndidi nke ha ji enwe obi ọmiiko"". Ndị ọzọ kwuru sị na ""ha kwesịrị iji obi mmadụ na obi Chineke arụ ọrụ ha"" Mana ndị nke ọrụ ndị nọọsụ na-amasị nke ọma gara n'ihu kpeere ha ekpere, ma sị ka Chineke gbaa ha ume ma nye ha ike ha ji arụsi ọrụ ha ike. Lee tu ha si zaa ya n'Instagram: Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-52619009 +business Aliko Dangote: Mgbe m hụrụ nde dọla 10 nke m n'anya ka m kwetere na m enwere ego n'ezie "Akụkọ anyi hụpụtara n'ụtụtụ a Onye bụ ọkachasị nwee ego n'Afịrịka bụ Aliko Dangote sị na ọgbara ya ka ""ịhụ ị kwe"" maka ego ya. Dangote gwara nzukọ Mo Ibrahim emere n'Abijan, isi obobo mba Ivory Coast, na o nwere mgbe ha gara ụlọ akụ ga wepụta nde dọla iri ka obi sie ya ike na ide ya bụ abụghị so n'akwụkwọ. Ọ sị; ""Mgbe ị dị ntoroọbịa, nde mbụ ị ga-akpata dị oke mkpa, mana ya gafee, ọnụ ọgụgu ndị ọzọ adịghị adị ka ihe ọbụla."" ""Otu oge, agara m ụlọ akụ, wepụta nde dọla iri, tinye ya n'ime ụgbọala m, buru ya ga ụlọ m wee kiribe ya. Ekirichara m ya wee kpebie na enwere m ego. Ka chi foro, ebughachirim ya n'ụlọ akụ."" Ndị mmadụ mere ngaghari iwe n'Abuja ụnyaahụ maka ogbugbu mmadú ka na-aga n'ihu na Zamfara steeti. Ótutú n'ime ha sí na góvano na-chi steeti ahú biú Abúbakar Yari na onyeisiala Naíjiría bu Muhammadú Buhari anaghi eme ihe ha kwesiri maka okwua. Buhari n'onwe ya tinyere ọnụ na ya bụ okwu wee si na ya bụ onyeisiala obi na-asugbu karịa n'ụwa dum maka ogbugbu mmadụ a. Ọ sị ndị ihe mere ka, ma sikwa na ya na-agba mbọ ịhụ n'okwusiri. Onye ngalaba United Nations kwadoro ka ọ na-ahaziị ihe na mba Libya bụ Fayez al-Serraj ekwuola na ya na ndị agha ya ga-echebiri ọchịagha Khalifa Haftar n'isi obodo mba ahụ bụ Tripoli Ọchị agha Haftar na ndị agha ya nọ na njem ha si ga-ebi mgbe ha nwụchịrị Tripoli. Mmadụ 136 esịla Libya laghachịte Mmadụ iri itoolu emiela mmiri na Libya" https://www.bbc.com/igbo/afirika-47844011 +politics George Obiozor: Buhari agbarụọla ihu maka mwakpo e mere n'ụlọ ya "Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla mwakpo mere n'Imo Steeti nke gụnyere ogbugbu ndị uweojii na ịgba ụlọ onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ George Obiozor ọkụ. N'ozi onye ndụmọdụ ya bụ Garba Shehu wepụtara, Buhari tiri Obiozor na ndị uweojii aka n'obi maka ọdachi ahụ. Buhari sị na mwakpo ndị a bụ ihe oke mwute ma kwee nkwa na ọnọdụ nchekwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ ihe a na-eleba anya. Ọ rịọrọ ndị Imo Steeti ka ha dere jụụ ma nyere ndị uweojii aka ịchọpụta ndị na-akpa arụ. Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma ekwuola na ọ bụ ndị omekome si n'aka ndị ndọrọndọrọ ochịchị tụrụ ogbunigwe n'ụlọ onyeisi otu Ohaneze ndigbo bụ George Obiozor n'isi ụtụtụ Satọde. Uzodinma kwuru na ọ bụ ihe nwute na ụfọdụ ndị ndọr��ndọrọ ọchịchị ekweteghị na ọbụghị ọgụ ka aga-eji egbo nsogbu, agbanyeghị arịrịọ a na-arịọ ha. O bụ n'akwụkwọ ozi gọọmentị Imo steeti depụtara ka o kwuru nke a. O gosịpụtara obi nwute ya na ọ bụ ọgbaaghara oge niile ka ụfọdụ ndị ndọrondọrọ ọchịchị ji egbo nsogbu ha ma sị na Gọọmentị Imo Steeti agaghị anabata ụdịrị agwa a ọzọ. N'okwu, ọ gara n'ihu kọwa, "" Oge ndị na-akpa ụdịrị mkpamkpa n'Imo steeti abịala n'isi njedebe. Anyị ga-achọta ha ma hụ na atara ha ahụhụ dịka iwu Naijirịa siri dị"". Uzodinma kwuru na ọ ghọtaghi ihe eji wakpoo ụlo onye na-abụghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị kama na ọ bụ onye na-achọ ọdịmma ndị Igbo. Dịka o tiri George Obiozor aka n'obi, ọ gwara ndị Imo Steeti na gọọmentị ga-eme ihe niile dị n'ikike ya ịhụ na echekwara ndị nakwa akụnụba ndị Imo steeti niile. Ndị uweojii nke Imo steeti ekwuola na ha ebidola nyocha ha ji achọpụta ma nwuchie ndị wakoro ma gbaa ụlọ George Obiozor onye bụ onyeisi otu Ohaneze nke dị na Awo-Omanma, Oru, Imo Steeti ọkụ, n'ụtụtụ Satọde a, ụbọchị 19 nke ọnwa Maachị 2022. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Imo steeti bụ Mike Abattam kwuru nkea ma sịkwa na kọmịshọna uweojii steeti ahụ bụ Rabiu Hussaini nyere iwu ka ebido nyocha ma kwusie ike na a ga-ejide ndị kpara arụ a n'oge adịghị anya. Dịka o siri dị, enweghị etu ya bụ mwakpo siri metụta onye ọbụla dịka Obiozor anọghị n'ụlọ mgbe ya bụ ihe mere. Abattam kwuru sị, ""Mwakpo awakporo ụlọ ọkankuzi George Obiozor nke dị n'obodo dị na mpghara ọwụwa anyanwụ nke okpuruọchịchị Osu nke dị nImo Steeti. Enweghị onye ọmetụtara. Nyocha ebidola ozugbo ozugbo"". Dịka otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya si gwa BBC Igbo, ndị omekome ahụ ruru itoolu (9) bu ụgbọala abụọ nyabata ma mụnye ọkụ n'ụlọ ahụ dị n'obodo ya n'Awo-Omamma. Etu e si gbuo ndị uweojii abụọ na mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii n'Umuguma Ndị uweojii abụọ nwụrụ na mwakpo ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wakporo ụlọọrụ ha dị n'Umuguma, Okpuru ọchịchị Owerri West, Imo steeti n'isi ụtụtụ Satọde. Dịka onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ si kwuo, e ji mma wakasịa otu n'ime ndị uweojii a ahụ, ebe mgbọ gbagburu onye nke ọzọ. Onye uweojii nọ ọrụ ma jiri ndụ ya rie mbombo ọsọ oge ihe ahụ mere ma na-achọghị ka a kpọọ aha ya, gwara BBC na ndị omekome ahụ bu ma egbe ma mgbọ wakpoo ụlọọrụ ha dịka ha dọchichara ihu ụlọọrụ ha. Ndị obodo ahụ nọ oge ihe mere, gwara onye ntaakụkọ BBC na ndị omekome ahụ tụbanyere ogbunigwe n'ụlọọrụ ndị uweojii ma kwawa mgbọ. Ha kwukwara na ndị omekome ahụ bịara chebiri ndị uweojii na-agba ọsọ ndụ, mana ha gburu Iyke na Ifeanyi bụ ndị ha nwetanwuru. Otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru sị ""Ifeanyi bụ onye Umunkwo n'Umuguma ebe a. Ọ nọ n'afọ ikpeazụ ya na mahadum Imo State University, naanị otu afọ ka ọ rụrụla ọrụ uweojii a. Ọ nọ na-achọ ịwụ mgbidi aja tupu ha ejiri mma wakasịa ya ahụ, ọ nọrọ ebe ahụ nwụọ ozugbo."" ""Onye nke ọzọ bụ Iyke bụ onye Avu. Ha gbara ya egbe n'ụkwụ ebe ọ na-agba ọsọ. A hụrụ ozu ya n'ebe ọ dị ka ọ kwụsịrị ịṅụ mmiri. Ihe nke a nwere ka ọ dị."" Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ si Owerri bịazịrị mmenyụọ ya bụ ọkụ n'ụtụtụ ahụ. Nke a na-abịa dịka osote onyeisi ndị uweojii Naịjiria bụ Isaac Akinmoyede, bụ onyeisi mpaghara zone 9 nke Umuahia, hapụrụ steeti ahụ ka ọ bịachara njem ọrụ otu ụbọchị." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60805102 +politics Praịm Mịnịsta mba Briten bụ Theresa May akwala arịrị Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Praịm Mịnịsta mba Briten bụ Theresa May akwala arịrị na aka Yunịated Kindom dị n'asị akpọrọ ndị na-enwe mmorịkọta nwoke na ibe ya nakwa nke nwaanyị na ibe ya. Cheta na mba Naịjirịa na Yuganda so na ndị nyere iwu megide ụdị mmekọrịta ahụ, agbanyeghị ọgụ a na-alụ ịkwụsị ya. Ndị Sịnetị agwala Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa bụ Mansur Dan-Ali, Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Kemi Adeosun na Onyeisi CBN bụ Godwin Emefiele ka ha wụchie n'ihu ha. Oku a bụ maka ego dị nde dọla narị anọ iri isii na abụọ ha jiri zụo ụgboelu Helikọpta nke ndị Sịneti na-akwadoghị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:O Onyeisiala Mohammdu Buhari akpọpụtala Onye ọkaiwu bụ Festus Keyamo(SAN) dịka onye na-echute ọnụ ya n'ihe ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019. Keyamo n'akara tuwita ya dere na ọ ga-enye nzaghachị maka nke a n'oge dị n'ihu. N'egwuregwu Eriela onye na-agbara Chelsea bọọlụ ebe azụ Marcos Alonso iwu maka ịme ihe ike megide Shane Long nke Southampton Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Ingland bụ FA kwuru na ọ gaghị agba asọmpi ha nwere n'ụbọchị ụka na-abịa abịa. Nkeji nke mgbede a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Chibuike Josh Alfred a na-akpọ Josh2Funny bụ onye ọkpaọchị kọwara etu o jiri bido ịkpa ọchị. https://www.bbc.com/igbo/afirika-43787359 +health Etu esi jide ndị na-arụ ọgwụ ike n'Enugwu Calista Udomma Meka bụ ọnụ na-ekwuru NDLEA gwara BBC ETU aka si kpara ndị na-arụ ọgwụike n'Enugwu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-47787163 +health Healthy living: Ka ị ga-esi gbanahụ 'ọdịda n'ike' na-ebute ọnwụ.' Dika a na-enweta akụkọ ndị mmadụ na-anọkata daa nwụrụ, ọ na-agbagọjụ ụfọdụ anya etu dimkpa maọbụ agada agada nwaanyị ga-esi nọkata daa ma nwụrụ. Dibia bekee bụ Chidimma kwuru ihe ole na ole nwereike ịkpata ya bụ ọdachị nakwa ogbugbo ya. Ihe ụfọdụ ụzọ ndị ahụ dọkịta Chidimma kpọpụtara. 1.Oke ndọli: O kwuru na nsogbu a na-emekarị n'etiti ndị ọgbara ọhụrụ a na-adọlị n'ime oke ahụhụ ịkpata ihe ọnụ ga-eri. Ogbugbo: Nwete ezumike zuruoke. 2. Oke ọbara mgbalielu: Ogbugbo: Na-anwụ ọgwụ ga-ebutedata ya nke dọkịta gị ji aka ya nye gị. 3. Oke ọbara mgbatu ala: Ọgbugbo: Lele ahụ gị n'ime ọnwa isii ọbụla ka ịchọpụta nke a ma nata ndụmọdụ zuruoke n'aka dọkịnta gị 4.Afo ime: Dọkịta Chidimma kwuru na ndị ime nwereike ịda mgbe ọbụla. Ogbugbo: Nata dọkịta gị ndụmọdụ ma ịchọpụta na ị na-adakarị ma ị dị ime. 5.Anwụghị mmiri: Nke a pụtara na onye ahụ anaghị aṅụ mmiri ọfụma. Ogbugbo: Dọkịnta Chidimma kwuru na ọ ga-adịmma ka mmadụ na-agba mbọ hụ na ọ na-aṅụ mmiri ugboro gboro n'ụbọchị 6. Oke egwu Ogbugbo: Ihe hija gị n'ike ,jide obi aka. 7. Oke ụfụ Ogbugbo: Nabata ọgwụ dọkịta gị nyere gị maka nke a 8. Etu isi ekulite n'ụra: Dọkịta Chidmma kwuru na etu mmadụ si ekulite n'ụra nwerike ịkwatụ ya n'ike maọbụrụ na omeghị ya ọfụma. Ogbugbo: Ikulite n'ụra, tụgharịa n'akụkụ gị nọrọ oge tịnkọm tịnkọm, nọrọala oge tịnkọm tịnkọm, chituo ụkwụ gị n'ala oge tinkọm tịnkọm ma rituo n'oge na-adịghị anya n'elu akwa. N'ikpeazụ dọkịnta Chidimma kwuru na ọ ga-adị mma ka mmadụ na-ewepụta oge na-aga na-enyocha ahụ ya opekatampe otu ụbọchị n'ime ọnwa isii. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50138262 +health Coronavirus: Ozi ọma maka coronavirus Ọbụghị naanị akụkọ ọjọọ ka e kwesịrị ịgbasa banyere ọrịa coronavirus. E nwekara akụkọ ọma. Kamgbe ọrịa coronavirus malitere kpawa ike, a nụla ọtụtụ akụkọ ọjọọ gbasara ya n'akụkụ ụwa niile. Akụkọ etu coronavirus si egbu puku kwuru puku mmadụ abụghịzi ihe ọhụrụ. N'ụbọchị Mọnde, ọrịa a gbukwara otu onye na Naịjirịa. Ma lee akụkọ ndị na-enye obi aṅụrị gbasara ọrịa a. Akụkọ ndị a gosiri na olileanya dị. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52001037 +sports Manchester United vs Liverpool: Man Utd ahụla Liverpool teta n'ụra ọnwụ "Liverpool tiwara ndị ji ha hibe isi maka imeri Manchester United obi taa, ka ha gazịrị bụrụ ndị na-asa goolu. Ọtụtụ ndị gụnyere ma ndị na-akwado Man Utd, chere na ha ga-eji goolu gbajuo ndị Man Utd afọ maka etu ahụ si ama ha ririri na bọọlụ kemgbe izu ole na ole gara aga. Mana ha bịara ""teta n'ụra"" n'azụ ụlọ ha na Old Trafford, wee sị ndị Liverpool ""ọ bụghị taa!"" ka egwuregwu mechara bie n'otu goolu otu goolu. Adam Lallana nke Liverpool ji ibu kara aka gbakaa neetị David De Gea na nkeji 85 na-erughi nkeji ise e webatara ya na bọọlụ, iji sata otu goolu Man Utd nyere ha n'ọkara nke mbụ. Marcus Rashford bu ụzọ bie Alisson ""stamp"" ka ọ gbakara neetị ya na nkeji 36 e ji bido bọọlụ. Maka etu goolu a si gaa, e mechara were ihe nkiri Video Assistant Refree (VAR) ji nyochaa ya, iji mara ma ọ dabara. Ka ọ dị ugbua, Man Utd esila n'ogogo 14 rigoro nke 13 na tebulu, ebe Liverpool ka nọkwa bụrụ ndị a na-emeribeghi kemgbe Premier League nke afọ a bidoro. Ihe ndị mmadụ na-ekwu: @Kheeng_jay na-ama ndị Man Utd njakịrị sị na ha si ebe ha zoro maka ụjọ mmeri na-arịpụta. @UgwunnaEjikem sị na ọ dị ka ike adịghị ndị Liverpool ịzọ ọkwa mbụ na Premier League nke afọ a, maka etu ha si atufu pọịntị. @ivanmerlo21 tinyere ihe na-egosi etu obi si dị ndị Man Utd pọlịna pọlịna oge Rashford nyere goolu ya. @AJno9 kwuru na ọ bụ ogbuopi ka e kwesịrị inye ""ọkacha gbaa n'egwuregwu a"". Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50103753 +business Insurance in Nigeria: Uru dị n'ikpuchi azụmaahịa gị maka ọdachi Igbo tụrụ ilu sị 'Agha a gbara ama ya, a dịghị eri nwa ngwọrọ', nke a bụ ka ọ dị n'ihe banyere ikpuchi akụnaụba (Insurance) mmadụ maka ọdachi. Akụkọ a kọwara uru dị nakwa usoro onye azụmaahịa ọbụla nwereike iji chekwaa ngwaahịa ya maka ọdachi ndị gụnyere ọkụ ọgbụgba, mmiri oriri maọbụ izu ya n'ohi. Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ngwaahịa ndị mmadụ lara n'iyi n'ọkụ gbara n'ahịa Ọchanja, Ọnịcha n'izuụka gara aga. Otu onye ọkacha n'okwu banyere ikpuchi akụnaụba bụ Golden Akukwe, kọwara uru ndị a ma nye ntuziaka etu e si eme nke a. Ọ sị na uru gbara ọkpụrụkpụ dị na mmadụ ikpuchi azụmaahịa ya bụ na ụlọorụ na-ahụ maka nke a (insurance company) ga-akwụghachị ya ụgwọ ngwaahịa ndị ahụ ma ọ bụrụ na ihe mee ha. O nyere ndị na-achụntaego ndụmọdụ ka ha gbalịa kpuchie ngwaahịa ha maka 'ihe Ọnịcha gwara Obosi'. Akukwe sị na ọ hụbeghi ọghọm dị na mmadụ ikpuchi ngwaahịa ya ma ọ bụrụ na onye ahụ mere ya n'ụzọ ziri ezi. Kedụ usoro mmadụ ga-eji kpuchie azụmaahịa ya? Akukwe kọwara ụzọ onye azụmaahịa nwereike iji kpuchie ngwaahịa ya maka ọdachi. Ọ sị na onye ahụ ga-eme ihe ndị a; Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50205502 +business Nigerian Border Closure: 'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border'' Ọtụtụ ụmụ Igbo na-azụ ma na-ere ahịa gbarụọla ihe na mmechi okeala Naịjirịa na mba ndị nke gọọmentị mechiri. N'ime nyocha BBC Igbo mere iji mata etu mmechi okeala a si metụta ha, ha kwuru na onweghi ahia ha na-azụta. Na nke a mere ha ji erezi ngwaahịa ha oke ọnụ, nke ndị na-azụ ha ahịa na-eme mkpesa banyere ya. Mana otu onye sị na nke a emetutaghị ya maka na ọ na-eji ụgbọelu ebubata ngwaahịa ya si na mba Chaịna. Kirie ihe ha kwuru n'uju. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50078882 +politics Rivers Election Collation: Wike awụọla onye Amaechi na-akwado n'ala Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas Steeti emeriela ọzọ na ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Rivas Steeti. Ụlọọrụ Inec na Rivas Steeti kpọpụtara mmeri Wike n'ehihie Wednezde n'ọnụ vootu dị 886,264 dịka Ọkamụta Teddy Adias bụ onye 'Returning Officer' na ntuliaka ahụ. Onye AAC bụ Biokpomabo Awara nwetere vootu dị 173,859 iji na-esote Wike n'azụ na ntuliaka emere n'abalị itoolu nke ọnwa Maachị Mpụtara ntụliaka a bụ vootu si n'okpuruọchịchị iri abụọ na otu n'ime okpuruọchịchị iri abụọ na atọ nke mejupụtara Rivas Steeti. Okpuruọchịchị Abua Odua na Gokana enweghi ihe mpụtara ọbụla n'ihi ọgbaghara dapụtara mgbe a na-eme ntuliaka nakwa mgbe a na-agụkọ mpụtara ntuliaka ebe ndị ahụ. Nke a si na mkpesa Gbaranor Godwill Christian mere mkpesa nke a dịka a na-achọ ịgụkọ mpụtara ntulaiaka. Ụlọọrụ Inec na Rivas Steeti malitere ọzọ na Wenezde ịkpọpụta mpụtara vootu ọkwa gọvanọ na Rivas Steeti. Na mkpọpụta vootu nke taa mgbe e dere akụkọ a, Gọvanọ Nyesom Wike nke PDP ji ihe karịrị vootu puku narị ise emeri. N'okpuruọchịchị obodo Ogu Bolo, AAC nwetere vootu 814, ebe PDP ji 11855 vootu. N'okpuruọchịchị obodo Obio-Akpor, AAC ji 7495, PDP nwetere 281164 vootu. Okpuruọchịchị Asari Toru, AAV nwetere vootu 18945, PDP ji vootu 32172. Na nke Degema, AAC ji vootu 5071, PDP nwetere 12133. Ọnụgụgụ vootu sị n'okpuruọchịhcị iri na itoolu bụ PDP: 763,603, AAC: 162,180. Onye nke na-esote Nyesom Wike bụ Biokpomabo Awara nke AAC. Cheta na ha kwụsịtụrụ mkpọpụta mpụtara ntuliaka Rivas Steeti rue n'elekere iri nke ụtụtụ taa bụ ụbọchị atọ n'ọnwa Epụrel. Ha malitere ịkpọpụta mpụtara n'ehihie ụnyaahụ dịka ụlọikpe chabichara ikpe n'akwụkwọ ndị pati AAC na ndị ọzọ gbara ka akwụsị Inec ikpọpụta mpụtara ntuliaka a. Ndị ọrụ Inec si n'okpuru ọchịchị iri na asaa nke steeti ahụ zuruoke ebe ndị ọrụ nchekwa jupụtara n'isi ụlọọrụ ndị Inec dị na Rivers Steeti bụ ebe a na-eme mkpọpụta vootu ahụ. Ndị anya na-ele na ntuliaka bụ Nyesom Wike, bu aka na-achị steeti ahụ, na Awara Biokpomabo, na-azọ ọchịchị n'okpuru pati AAC. Dịka ọ dị ugbua, a kpọpụtala mpụtara okpuruọchịchị obodo dị iri na ise ndị gụnyere Portharcourt, Ikwere, Andoni, Oyigbo, Eleme, Opobo-Nkoro, Bonny, Okrika. Ndị ọzọ gụnyere Akuku-Toru, Omuma, Tai, Ahoada, Emohua, Etche na ONELGA. N'ime okpuruọchịchị obodo iri na ise ndị a, AAC meriri na abụọ ebe PDP meriri iri na atọ. Mana a kwụsịla mkpọpụta mpụtara ntuliaka a rue n'elekere iri nke ụtụtụ echi bụ ụbọchị atọ nke ọnwa Epụrel, 2019. https://www.bbc.com/igbo/afirika-47779523 +politics Akụkọ dị mkpa: APC eyigharịala ntụlịaka imeụlọ ekwesiri ime tata "Akụkọ kachasị dị mkpa taa: APC sịzị na ntụlịalaka imeụlọ bụzị echi Ka ọ dị ụgbụa, otu APC ebughariela nhọpụta imeụlọ ha hibeburu Mọnde. Ya bụ nhọpụta imeụlọ ga-abụzị echi ebe APC Imo steeti ahọpụtala onyeisiala Buharị dịka onye ga-anọchite anya ha na ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019. Onweghị onye ya na ya zọrọ ọnọdụ a na steeti ahụ. Mgbe BBC Igbo gaara n'ulooru APC n'Enugu steeti imaata ihe na-eme ha kwuru na ọ ga-aga ihu echi, mana ha ekwughi oge o ga-amalite maọbụ ogige a ga-ano mee ya bu ntuliaka. Ha kwuru na ndenye aha ndi eme ntuliaka nke bu ""accreditation of delegates"" ga-amalite n'elekere asato nke ututu n'Okpara square. Nke a mere na ufodu n'ime ha agaghi aga uka BBC achọpụtala na-ezie na Idemmiri gburu Okechukwu Osadebe bụ nwa onye egwu, Osita Osadebe ụnyahụ. Ahuru ozu ya na ụtụtụ tata bụ Satọde. Aisha Jummai abanyela pati ọzo Ka ọ dị ụgbụa, otu APC ebughariela nhọpụta imeụlọ ha hibeburu tata. Ya bụ nhọpụta imeụlọ ga-abụzị echi ebe APC Imo steeti ahọpụtala onyeisiala Buharị dịka onye ga-anọchite anya ha na ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019. Onweghị onye ya na ya zọrọ ọnọdụ a na steeti ahụ. N'egwuruegwu, West Ham ewerela ọkpụ atọ asatara otu (3 - 1 )nyụọ ndị Manchester United anya na asompi premier League tata. Rashford nke Man. U ji otu ọkpụ ahụ gbara isi onwe ya. Ogbugbu ndị Naịjirịa na Ghana Buhari na onyeisiala Nana Akufo Addo nke Ghana zutere ebe ha kpara maka ihe ndị Naịjirịa na-azụ ahịa na mba ahụ na-agabiga. Addo kasiri ya obi ma gwa ya na amaghị ama awakpo ndị Naịjirịa. N'akụkọ yiri ya, Onyeisiala Muhammadu Buhari ebunyela Tony Iwobi bụ onye isiojii mbụ bụ onye omeiwu na mba Italy ụkpa ekele maka ọkwa ya. N'akụkọ ọzọ, Gọọmentị Plateau steeti amachiela ndị mmadụ ịpụta ezi site n'ụtụtụ ruo n'abalị na mpaghara ugwu na ndịda Jos dịka e gburu mmadụ iri na anọ n'ụlọ n'obodo Rukuba na steeti ahụ. Na mba ofesi, Ihe ruru mmadụ iri atọ anwụọla n'ihe mberede alaọmajijiji n'obodo Palu dị na mba Indoneshia. Cheta na alaọmajijiji a kpakwara mkpamkpa n'obodo Lombok dịkwa na mba ahụ ebe o gburu ihe karịrị mmadụ narị anọ na iri isii. N'egwuregwu, Chelsea na Liverpool ga-akwakọta mpi na mgbede taa na Premier League. Cheta na Chelsea ji ọkpụ abụọ asatara otu gbapụ Liverpool n'asọmpi Iko Carabao oge ha zutere ụbọchị abụọ gara aga. Nwaanyị onyeọcha na-asụ Igbo karia ufọdụ ndị Igbo ekwuola ka o si wee mụta asụsụ Igbo n'ụzọ dị mfe." https://www.bbc.com/igbo/afirika-45690972 +sports Football Freestyle: 'Eji m iko bọọlụ enyere onwe m aka n'ụlọakwụkwọ' Nwada Blessing Faith Onyemaucheya bụ onye na-agba bọọlụ kọwara etu o si malite iji iko bọọlụ enyere onwe ya aka n'ụlọakwụkwọ. Ọ sị na ọ malitere inwe mmasị n'ịgba bọọlụ mgbe ọ dị na nwata, nna ya na-akpọ ya a ga-ekiri bọọlụ. Dịka o tolitere, ọ malitere gbawa bọọlụ mana o nwebeghi ohere ịgba ya ruo ebe ọ ga-enye ya ego. Nke a mere o jiri malite iko bọọlụ iji mee ndị mmadụ obiụtọ ma na-enwete ego na ya. Blessing agakwala ọtụtụ asọmpi iko bọọlụ ma rite nturuugo dị iche iche. Kirie ihe o kwuru n'uju. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter na Ikechukwu Kalu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51338296 +business Emirates, Etihad, Kenya Airways na ndị ọzọ etinyela iwu ị kwesịrị ịhụ tupu i mee njem "Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọelu akpọrọ Federal Airport Authority of Nigeria (FAAN) bụ Henrietta Yakubu kwuru na o nweghị ihe ngalaba ahụ ga-eme maka usoro ụlọọrụ ụgbọelu si ofesi hiwere maka ụmụ Naijiria na-aga mba ọzọ. Nke a na-eme dịka ụfọdụ ụloọru ụgbọelu dịka Emirates, Etihad, Kenya Airways na ndị ọzọ tinyere iwu nke kwuru na onye ọbụla sị Naijirịa chọrọ iso ụgbọelu ha mee njem ga-egosirịrị akwụkwọ nnyocha coronavirus nke gosiri na ha ebughị ọrịa ahụ tupu ha ekwe buru ya. Ha kwuru na akwụkwọ ahụ a ga-eme nnyocha ahụ n'ime abalị anọ tupu onye ahụ emee njem ya. Usoro ndị a gụnyere na onye ọbụla sị Naijirịa eme njem ụgbọelu a ga mba ọzọ ga-egosi ha akwụkwọ nyocha na-egosi na o bụghị ọrịa coronavirus. Nke a wepụrụ ohere ndị mmadụ nwere ịkwụ ụgwọ njem n'oge ka ọ beere ha ego, ebe ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ha anaghị enweta mpụta nyocha ha n'oge . Yakubu kwuru sị ""Obodo niile nwere ikike ihiwe usoro nke ha maka nchekwa ọrịa coronavirus, o nweghị ihe ụlọọrụ FAAN ga-emewnu maka nke a"". O kwukara sị ""Ka mmadụ niile mee njem ofesi nanị mgbe ọ dị mkpa ma ka ha bido kwa n'oge haziwe ihe niile ha ga-eji eme njem a n'oge"". Dịka Naijirịa ebidobeghị njem ụgbọelu nke ofesi, Yakubu na-ekwu na ha na-etikọ isi ọnụ iji wepụta usoro njem ndị si ofesi chọrọ ịbata Naijirịa. Lee ụfọdụ ndi ụlọọrụ ụgbọelu hiwere usoro a: Emirates Etihad Kenya Airways Qatar Airways Cheta na e hinyeburu mmalite njem mba ofesi n'ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọst, tupu e bugharịa ya gaa ụbọchị ise nke ọnwa Septemba. Dịka a na-akwado maka mmehe njem ụgbọelu mba ofesi ụbọchị Satọde na-abịanụ, onyeisioche ọrụ ọtawaike COVID-19 bụ Sani Aliyu adọọla aka na ntị na onye njem ọbụla ghọrọ aghụghọ maka nyocha nje coronavirus na gọọmentị Naịjirịa ga-amachi ya ịbata obodo a. O kwuru nke mgbe ndị otu ọtawaike COVID-19 akpọrọ Presidential Task Force on COVID-19 na agwa ndị nta akụkọ okwu ụnyaahụ. Aliyu kwuru bụ onye kwuru nke a n'Abụja ụbọchị Mọnde sị na ha ewepụtala usoro ọhụrụ maka ndị na-eme njem sị mba ofesi dịka Naịjirịa na-ejikere ịmehe njem ụgbọelu mba ofesi ọzọ ụbọchị Satụde. O kwuru na onye ọbụla na abata Naịjirịa ga-eme nnyocha ahụ Bekee kpọrọ ""Polymerase Chain Reaction test for COVID-19"" n'obodo ha si, wekwara mee ọzọ mgbe ha rutere Naịjirịa. Ọ sị na ndị dara ya bụ ule ahụ agaghị abata Naịjirịa. Ndị ụgbọelu ghọrọ aghụghọ maka ule ndị a ga-akwụ nha $3,500 maka otu onye njem dara iwu a. Ọ dọkwara ha aka na ntị maka onye njem ọbụla agaghị eme nnyocha hụ nke aga eme abali asaa onye ahụ batachara Naịjirịa. Aliyu sị ndị ọrụ Immigration ga-akagbu akwụkwọ ikike njem ya. O kwuru na ya bụ mpụtara nnyocha agaghịzị adị ire ruo abali iri na anọ (14), dịka akara mbụ, kama na ha emeela ya abali asaa malite ụbọchị ha mere ya, na agaghị akarị abali abụọ tupu ha amapụ ya bụ njem. O kwukwara na onye ọbụla ga-aga eme ya bụ nnyocha na Naịjirịa ga-akwụ ụgwọ ya malite na 29 ọnwa Ọgust 2020. Ọgọst 29: Njem ụgbọelu ofesi ga-amalite na Naịjirịa n'ụbọchị a Minista na-ahụ maka njem ụgbọelụ bụ Hadi Sirika ekwuola na njem ụgbọelu ofesi ga-amalite na Naịjirịa n'ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọst. O kwukwara na ọ bụ ọdọụgbọelu Legọs na Abuja ka njem a ga-ebu ụzọ malite. O kwukwara na ọ ga-ewepụta usoro nakwa iwu ndị pụrụiche ga-ekpuchi njem a n'oge adịghị anya. Mana akụkọ si n'akụkụ tebulu otu ""presidential task force"" na-ekwu na esubeghị oge mmepe njem ofesi kpọm." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53655643 +politics Ipob n'Emene: Ana m agara onwe m ụka mgbe a gbara m egbe- Nwoke a kụrụ ịga n'Ụlọgwụ 'Orthopaedic Enugwu' "Otu nwoke nọ n'ụlọ ọgwụ Orthopedic Enugwu aha ya bụ Abraham Ani etiela mkpu sị ndị uwe ojii wepụ ya ịga ha kedoro ya n'ụkwụ n'ihi na ya abụghị onye IPOB. Abraham gwara BBC na nsogbu ya malitere ụbọchị ụka 23 August oge ndị IPOB na ndị uwe ojii nwere nsogbu. Abraham Ani sị na ndị uweojii kedoro ya n'akwa dị n'ụlọgwụ Orthopaedic dị n'Enugwu n'ihi na ha na-ebo ya na ọ bụ onye Ipob. ""Onye ọrụ nchekwa gbara m egbe n'ụkwụ n'ụbọchị 23 Ọgọst ndị IPOB na ndị uweojii nwere nsogbu n'Emene."" Okwuru na ya na-aga ụka oge ya zutere ndị na-eme ọgba aghara n'ihu St Josephs catjolic Churcj Emene, ngwa ngwa ya mere ka ya gbapụ ọsọ zoo, otu onye army agbajie ya ụkwụ. Abraham nọzị ugbua n'ịga ndị uwe ojii tụrụ ya wee na-akwa arịrị na ya na anyụzị nsị na mamịrị na bed n'ihi ịga atụrụ ya n'akwa ụlọ ọgwụ. Ka ọ dị taa, Abraham kwuru na ya enweghịzị ego, were anya mmiri kwo na gọmenti kwesịrị inyeghachi ya ụkwụ ka ọ dị n'mbụ n'ihi na aka ya dị ọcha. Mgbe BBC Igbo kpokuru ndị uweojii ka ha tinye ọnụ n'okwu a, ha asị na ọ nọ n'ụzọ njem, na ọ ga-asa anyị n'oge adịghị anya. Otu nwaanyị a ma ama maka ịgba mbọ maka ikike dịrị onye bụ Annkio Briggs agọọla si na o nweghị mgbe ya kwuru na ya na-akwado otu Ipob. Briggs pụtara n'akara Facebook ya kwuo na o nweghi mgbe okwu o kwuru iji katọọ ogbugbu mmadụ n'Emene ji ghọrọ na ọ na-akwado otu Ipob. O kwuru na ọ bụ ikike ruru ya ịkwụnyere otu ọbụla masịrị ya mana o nweghi mgbe o ji sonye otu Ipob. Cheta na o kwuburu na ndị ọrụ nchekwa enweghi ikike ọbụla ịga ebe ndị a na-enwe nzukọ na-ejighi egbe maọbụ mma ga-amalite ọgbaghara banyere n'igbu ndị mmadụ. N'aka ọzọ ọkaiwu Ipob bụ Aloy Ejimako sị na o kwenyere n'akwụkwọ otu a kpọrọ 'International Society for Civil Liberties & the Rule of Law' wepụtara maka ndị Ipob nwụrụ n'Emene. Ndị 'International Society for Civil Liberties & the Rule of Law' depụtara aha ndị ha sị bụ ndị Ipob nwụrụ n'Emene n'ụbọchị ha na ndị DSS na ndị uweojii nwere Ọ sị na otu a bụ otu a ma ama dịka ndị na-eme nyocha nke ọma tupu ha a pụta kwuo maọbụ dee ihe ọbụla. Ejimako sị na ọ na-atara ozi ahụ n'akara e-mail ma leba ya anya, na ihe niile ha dere bụ eziokwu kama na o zuchabeghi ezu. Ọ sị na o kwenyere na ya ma kpọọ oku ka ndị Igbo na Naịjirịa niile kwenyere n'akwụkwọ a. Ọ gara n'ihu katọọ ogbugbu ụmụafọ Igbo n'Emene ma kwuo na ndị aka ha dị na ya ga-ata ahụhụ mgbe oge ruru. Otu a kpọrọ 'Intersociety' na-ahụ maka ikike dịrị onye wepụtara akwụkwọ ozi bu aha gụnyere aha ndị ha sị na e gburu, a nwuchiri nakwa a na-achọ achọ n'ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị nchekwa na ndị Ipob n'Emene, Enugwu Steetị. Akwụkwọ ha a gosiri aha mmadụ isii e gburu egbu nakwa ndị ọzọ ha sịrị na a nwuchiri na ndị na-efu efu. BBC Igbo ka na-agba mbọ ị chọpụta ihe ndị uweojii nwere ikwu maka aha ndị a. Igwe Felix Ugwu, bụ eze ọdịnala nke obodo Emene dị n'Enugwu steetị gwara BBC ihe ọ ma maka ọgbaghara dara n'etiti ndị DSS na ndị Ipob nke butere ogbugbu mmadụ. Igwe Ugwu kwuru na ọ nweghị onye Emene so na ndị e gburu na nsogbu ahụ. Ọ dọkwara ndị mmadụ aka na ntị ka ha jiri nwayọ eso ihe nwere onwe maka ọ bụ ihe ejibu kwafuo ọtụtụ ọbala na gboo. Ọ sị: ""Ya bụrụ na ọ bụ uche Chukwu, anyị ga enweta nkewa Naịjirịa. Ya bụrụ na Chuwku ekweghị, anyị ka ga-anọkwa ebe anyi nọ. Cheta na onyeisi otu na-achọ Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu kwuru na ndị otu ya agaghị ekwezi ka ụdịrị ihe mere na Emene mee ọzọ, ọkachasi ebe o metụtara ogbugbu mmadụ. N'okwu okwuru na mgbasaozi o mere n'akara Facebok ya n'Abalị ụbọchị Wenesde, Kanu sị na ya agwala ndị otu ya ka ha dịrị njikere maka mwakpo ndị nchekwa obodo. Nke a na-abịa dịka aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi si ka ndị nara ndị uweojii ngwa agha ha weghachite ha. Ugwuanyi kwuru okwu a oge ọ na-ekwupụte ebumnuche a banyere ọbala a kwapuru n'Emene. Onye bụbu gọvanọ Anambra Steetị bụ Peter Obi sokwa na ndị katọrọ ogbugbu mmadụ a mere n'Emene. Obi depụtara nke a n'akara twitter ya ma kpọọ oku sị ka e mee nyocha iji chọpụta ihe kpatara ya ma gbochie ya n'ọdịnihu. Onye na-agara onwe ya bụ onye e gburu, gbaa ọkụ n'Emene - Anya hụrụ ihe mere Ndị hụrụ ihe mere n'ụbọchị mkpamkpa kpara n'Emene sị na onye ahụ bụ onye na-agara nke ya ka e gburu maka na o ji ekwenti ya ese ka ihe na-eme. Mana amaghị ndị mmadụ gburu ya ma ree onye ahụ ọkụ. Ma ndị Ipob, ndị uweojii na ndị DSS ekwebeghị kwuo mmadụ ole n'ime ha nwụrụ kpọmkwem kemgbe ya bụ ihe mere n'ụbọchị Sọnde 23 Ọgọst, 2020. Otu foto ndị mmadụ na-eke banyere mkpa mkpa kpara n'Emene abughị ebe ahụ ka o si. [Gbado anya maka foto ndị n'akara e tinyere ebe a na-egosi ozu na ọbara mmadụ] Foto a bụ nke otu onye Ipob tinyere na Twitter ha. Mana, ya bụ foto si Mba Cameroon, ebe ndi oji egbe na gọọmentị enye nsogbu maka nwere onwe ndị a na-akpọ Ambazonia. Lee ebe o bu ụzọ sepute isi na Twitter n'ebe a. Foto ọzọ si Nairaland ebe nke nwaanyị ji ọkọrọtọ Biafra si ebe a, n'oge ndị Ipob na ndị agha Naijirịa zutere n'afọ 2018. Aga-eme nchọpụta n'ihe mere n'Emene - Ohanaeze Ndigbo Ohanaeze Ndigbo agbarụọla ihu n'ogbugbu ndị mmadụ mere n'Emene dị n'Enugwu Steetị n'ụbọchị ụka mgbe Ipob na ndị nchekwa kwasutara onwe ha. Nke a dị n'akwụkwọ ozi onyeisi otu a bụ Nnia Nwodo wepụtara nke Emeka Attamah bụ ndụmọdụ ya tinyere aka na ya. Ohanaeze sị na ihe mere ha ji gba nkịtị kamgbe ihe a mere bụ maka ha chọrọ ịmatacha etu ihe a si malite. Ha sị na ozi ahụ na-efegharị bụ nke a sị na Nnia Nwodo dere bụ okpotokpo asị na Nwodo ekwubeghi okwu ruo ugbua. Mana ha kpebiri iwepụta ozi a site na mkparịtaụka ha na gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nke Enugwu Steeti nwere n'ụbọchị Wenesde. Ohanaeze sị na gọọment Enugwu ekwela nkwa ime ka ha mata ihe niile ha chọpụtara banyere mmadụ niile nwụrụ n'ọgbaghara a. Ha gara n'ihu kwa arịrị maka ọnwụ ụmụafọ nakwa ndị ọzọ nke a metụtara ma ṅụọ iyi isi imi n'ala chọpụta ihe mere. Ohanaeze nyere ndụmọdụ ka onye ọbụla dere juu ruo mgbe kọmitii gọọmentị Enugwu hiwere ga-emecha nyocha ha. Aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi akpọọla oku nzukọ kwam kwam nke ndị niile aka ha dị na nchekwa na steeti ahụ. Oku Ugwuanyi bịara abalị atọ ndị ọrụ ncheka na ndị otu Ipob kwakọrọ isi na steeti ahụ, nke butere ogbugbu ihe ruru mmadụ anọ. Ndị Ipob na-ekwu na ọ bụ mmadụ 21 ndị otu ha nwụrụ na ọgbaghara ahụ ebe ndị ọrụ nchekwa Department of State Services (DSS) sị na mmadu abuọ ndi ọrụ ha nwụrụ. Briggs na Ezekwesili akatọọla ogbugbu ndị Ipob n'Emene Ipob Emene: Ifeanyi Ugwuanyi akpọọla nzụkọ nchekwa kwam kwam n'Enugwu Otu nwaanyị ọnụ na-eru n'okwu bụ Annkio Briggs akatọọla ogbugbu e gburu ndị otu Ipob n'Emene dị n'Enugwu Steetị n'ụbọchị ụka gara aga. Ọ sị na ndị ọrụ nchekwa enweghi ikike ọbụla ịga ebe ndị a na-enwe nzukọ na-ejighi egbe maọbụ mma ga-amalite ọgbaghara banyere n'igbu ndị mmadụ. Ọ sị na ndị otu a nwere ikike igbere chi ọbụla dị ha mma, ma ọ bụ ụka ndị Jew maọbụ nke Kraịst. Ọ dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ hapụ ị na-agba nkịtị mgbe ọbụla e gburu ndị mmadụ n'ala Igbo maọbụ na Kaduna nakwa Naịjirịa gbagburu. Ihe Oby Ezekwesili kwuru N'otu aka ahụ onye bụbu mịnịsta agụmaakwụkwọ bụ Oby Ekwesili katọkwara otu ihe a mere n'Emene. O depụtara nke a n'akara twitter ya ma sị ka e mee nyocha banyere ihe kpatara ogbugbu ndị a. Hiwe 'panel' ga-enyocha ihe mere n'Emene - Ipob Ọtu na-achọ mwereonwe site na Naịjirịa bụ Ipob akpọọla oku ka e hiwe otu ga-enyocha ma chọpụta kpọmkwem ihe mere n'Eneme n'ụbọchị ụka. Otu onye so n'ọnụ na-ekwuru Ipob kpọrọ oku a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere banyere ọgbaghara dapụtara n'etiti Ipob na ndị ọrụ nchekwa. Ọ gara n'ihu sị na onweghi mgbe ndị Ipob mere ọgbakọ ji megide ndị ọrụ nchekwa gara kwasuo ha n'Emene dịka ime ọgbakọ bụ ikike dịrị onye n'iwu na Naịjirịa. O kwukwara na ndị uweojii ekwesighi igbu ndị Ipob, na ihe ha gaara eme bụ inwuchi ma kpọpụ ha n'ụlọikpe karịa ịgbagbusi ha. Onye ọzọ so na mkparịtaụka a bụ Chukwuka Ofoegbu (Ijele) sị na ndị Ipob kwesịrị ịma na iwu na Naịjirịa kpọrọ ndị na-eyi ndụ egwu nke bụ na ọgbakọ ha megidere iwu. Ofoegbu sị na ""ndị Ipob kwesịrị ịkwanyere onwe ha ugwu, na ọ dị njọ onye a na-azọ ndụ iji aka ya dabanye n'ọnụ agụ"". Ọ gara n'ihu sị na o wutere ya etu ndị mmadụ si nwụọ n'ụzọ na-ezighi ezi site n'ọgbaghara ahụ mere n'Enugwu. Kirie ihe ha kwuru n'uju ebe a: Ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu esorola katọọ ogbugbu e gburu ndị ntọrọbịa Igbo n' ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị nchekwa na Ipob n'ụbọchị Ụka. Guy Ikokwu, otu okenye Igbo ọnụ na-eru n'okwu ma bụrụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị welitere isi n'oge ọchịchị Shehu Shagarị gbarụrụ ihu maka ya. O kwuru na ndị na-achị anụ na-eji egbe na-emebi ihe mana o nweghị onye ọbụla n'ime ha ejiderela, kama na-egbusi ndị ntorobịa Igbo ejighị egbe ọbụla. Ikokwu sị na ""O nweghị obodo ụdị ihe ga-eme, ndị mere ya ala na nkịtị."" ""Ihe ha mere ụmụ anyị Osebuluwa ga-akwụ ha ụgwọ."" N'otu aka ahụ, onyeisi otu na-ahụ maka ikike dịrị onye a kpọrọ 'Billie Human Right initiative' bụ Innocent Amadi. N'okwu ọ gwara BBC Igbo n'ekwentị, Amadi sị na ihe nke a gwụrụ ike n'ihi na ndị a na-agbu bụ ndị na-ejighi egbe maọbụ mma. Ọ sị na ọnọdụ ndị Igbo na Naịjirịa bụ nke ndị a na-emegbu emegbu mana o nweghi onye na-ekwu okwu banyere ya. Amadi gara n'ihu dụọ ndị Igbo ọdụ sị ka ha kwanyere onwe ha ugwu n'ihi na anya a na-ele ndị Igbo adịghị mma. Sinetọ Enyinnaya Abaribe akatọọla ogbugbu e gburu ndị mmadụ n'Emene. Ọ na-asị ka ndị gọmenti hibe otu nnyocha ga-eleba anya n'etu ihe jiri mee n'Ọgọst 23, 2020 n'Emene dị n'Enugu. Abaribe kwuru nke a site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Uche Awom. O kwukwara na etu oke ogbugbu si eme mgbe ọbụla gosiri na o nwere ihe ọzọ so ya n'azụ. N'otu aka ahụ, onye nchịkọta otu gọvanọ ọwụwaanyanwu bụ ọkamụta Uchenna Ortuanya ekwuola na otu ahụ na-akwado ime ọgbakọ nlebanya gbasara mkpa mkpa mkpa kpara n'Emene. Ortụanya gwara BBC na ha na-eche ka oge ha ji eme ọgbakọ ruo ma na-ekwukwa na ha ga-eji aka ha kwupute ihe ha metere n'ọgbakọ ahụ. Nke a na-abịa dịka ọtụtụ mmadụ nọ na soshal midia akatọ nkịtị otu a gbara kamgbe ihe a mere. 'Kpọpụta aha ndị otu Ipob na DSS a sị nwụrụ n'ọgbaghara a' Nke ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ na ha chọrọ ka ewepụta aha ndị Indigenous People of Biafra(Ipob), DSS nakwa uweojii nọ n'Enugu kwuru nwụrụ n'ọgbaghara ahụ. BBC Igbo kpọrọ ndị isi Ipob nakwa ndị DSS ụnyahụ bụ ụbọchị iri abụọ na anọ ka wepụta ya bụ aha mana Ipob jụrụ ajụ ebe DSS kwuru na ha aghahị ewepụta aha ọbụla ugbua. Ohaneze ndị Igbo na-eme nnyocha Otu Ohaneze Ndịgbo nke Enugwu steeti ekwuola na ha na-enyocha ọgbaaghara dapụtara n'etiti ndị otu 'Indigenous People of Biafra' na ndị uweojii na steeti ahụ n'ụbọchị ụka. Onyeisi ha bụ Alex Ogbonna kwuru nke a oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka na mgbede Mọnde. Ogbonna kwuru na ya bụ ọgbaaghara nke butere ọnwụ ụfọdụ mmadụ, wutere ha nke ukwu. O kwuru sị: ""Anyị na-eleba okwu a anya iji matachaa etu ihe niile si mee."" ""Anyị na-akpọkwa oku ka gọọmentị leba anya n'okwu ma gbaa ya n'anwu."" ""Nkwa anyị na-ekwu bụ na ndị niile aka ha dị na ọgbaaghara ahụ agaghị ala na nkịtị. Oge BBC Igbo kpọkwara onyeisi Ohaneze Ndigbo na Naịjirịa bụ Nnia Nwodo, o kwuru na onweghi ihe ọbụla ya ga-ekwu n'ihi na ọ maghị ihe niile gbasara ya bụ okwu. N'otu aka ahụ, ọkaiwu ndị IPOB bụ Alloy Ejimako akatọọla mkpa mkpa kpara n'Emene. O kwuru na o jọgburu onwe ya na ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa ga-ahapụ ndị niile na-enye ala ahụ nsogbu ma chụwa ụmụ ntorọbịa na agbọghọbịa ala igbo na-ejighị ngwa ọbụla achọ okwu. Gere ihe o kwuru n'uju ebe a. Okwu Ejimako na-abịa dịka onyendu ndị otu Ipob bụ Nnamdi Kanu gwara ndị otu ya nọ n'Enugwu steeti ka ha kwusịtugodu ọgbakọ ọbụla ka elu na ala jụlatatụ oyi. Kanu kwuru nke a n'okwu ya ụnyaahụ na Radio Biafra mgbe ọ na-ekwu maka mkpamkpa kpara n'Emene Enugwu n'etiti ndị uweojii na Ipob. N'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii nke Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe, ha na-akọwa na ihe ruru ndị otu Ipob mmadụ narị ise kwuchiri ụzọ na-agba taya ọkụ n'ụzọ niile, wee nwuchie ndị uweojii nzuzo bụ DSS. Akwụkwọ ahụ kwukwara na Kọmishọna ndị uweojii bụ Ahmad AbdulRahman zipuru ndịọrụ ya ka ha ga bịanyụọ ọgbaghara ebe ahụ. Ndịọrụ nchekwa ahụ gụnyere ndị DSS, ndị uweojii na ndị agha Naịjria gara ebe ahụ mgbe ndị otu Ipob malitere ịkwa ha mgbọ. Mgbe ha saghachịrị ha site n'ịkwa mgbọ, mmadụ abụọ ndị otu Ipob nwụrụ ebe mgbọ merụrụ ọtụtụ n'ime ha gbapụrụ ọsọ ahụ. Ọ sị na ha zọpụtara otu n'ime ndị DSS ahụ ndị Ipob jidere, were hụ mmadụ abụọ ndị otu ha ndị ọzọ n'ozu ka ha tọgbọrọ. Ndukwe kwukwara na e jidere mmadụ ise ndị otu Ipob bụ ndị kwetere na ha so na ya bụ otu a machiri amachị. Ọ sị na ndị ahụ sị na ha nọ ebe a na-enye ha ọzụzụ mgbasị ahụike. Ha sị na ha hụrụ mma, okpiri akụnyere ntu na ekwentị dị icheiche ebe ahụ. 'Ndị uweojii gburu ndị Ipob 21, nwụchie mmadụ 47 n'ọgbaaghara mere n'Emene'- Emma Powerful N'aka nke ọzọ, Emma Powerful, bụ ọnụ na-ekwuru ndị otu Ipob, katọrọ mwakpo ahụ nke ndị uweojii wakporo ha n'Emene dị n'Enugu. Powerful kwuru na ndị otu ha nwụrụ mgbe a na-akwa mgbọ egbe ruru iri abụọ na otu ebe, ndị uweojii nwụchịrị mmadụ iri anọ na asaa. Gọvanọ Enugu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyị agaala ebe ndị uweojii na Ipob nwere ọgbaghara . Ndị ọrụ nchekwa na ndị bi n'ogbe ahụ mere ka ọ ghọta na ihe adajụọla kamgbe ọgbaghara ahụ dapụtachara ụnyahụ bụ ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Ọgọstụ. Ugwuanyị na ndị ọrụ nchekwa gara ebe ahụ na mgbede ụnyahụ. Na mbụ, onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu tinyere ọnụ n'ihe mere n'Emene. N'ozi o depụtara n'akara Facebook ya, o kwuru na oge eruola mgbe ndị uweojii ga-aghọta na ogbugbu ndị ejighi egbe ga-akwụsị ""n'ala Biafra"". O kwuru na ihe mere n'Emene ka bụ mbido ihe ga-abịa ma kwuo na ọ bụrụ na agaghị ekwe ha (ndị Ipob) mee ngagharịiwe n'udo, ha ga-eme ya n'esemokwu. Gụọ ihe o kwuru n'uju ebe a Cheta na ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị otu Ipob na ndị uweojii metụtara ụlọọrụ ndị uweojii nta dị n'Emene n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Ọgọstụ 2020. A hụrụ ọkọlọtọ dị n'ihu ụlọ uweojii ahụ n'ala nke gosiri na awakporo ebe ahụ mgbe ọgbaghara dapụtara. Mana ndị mmadụ laghachiwe n'ụlọ ha maọbụ ihe ha hapụrụ wee gbawa ọsọ ndụ. Mgbe ihe a mechara, ndị uweojii ka anọchichara ụzọ n'ebe dịka Eke Obinagu akụkụ ebe esi abata Emene ma gbochie ndị si Orie Emene apụta ịgafe ezi ahụ. Nchọpụta anyị gosiri na ọgbaghara ahụ malitere n'ụlọakwụkwọ Community High school Emene si ya fere St patricks college fee Ukwu Mango gaa Orie Emene. Maazi Henry nọ mgbe ihe a mere kọwara etu o si hụ ka e gburu mmadụ abụọ n'ihu ya mgbe ọgbaghara a dapụtara. Ọ kọwara na ihe a bidoro n'ụtụtụ ebe elekere asatọ mgbe ndị Ipob na-eme nzụkọ, na-ekpe ekpere, na-abụ abụ. ""Ndị DSS na SARS nakwa ndị uweojii batara n'ebe ahụ malite iti otu nwoke ihe, kụọ ya egbe ma merụọ ya ahụ. Nke a mere ka ndị ọzọ nọ n'ime ụlọ ahụ gbapụta bịa ịmata ihe na-eme."" O kwuru na ndị uweojii malitere ịgbasasi egbe ebe ahụ agbanyeghị na ndị mmadụ aka ha adịghị n'ihe merenụ na-eme ngafe ebe ahụ. ""Mgbọ tụtara mmadụ abụọ nwụrụ n'ebe ahụ ebe ihe ruru mmadụ iri isii merụrụ ahụ eburu ha gawa ụlọọgwụ"" Mgbe ọgbaghara a dapụtachara n'etiti Ipob na ndị uweojii n'Emene dị n'Enugu, onye ntakụkọ BBC gara ebe ahụ hụrụ ozu otu onye ebe ọ na-agba ọkụ n'Orie Emene. Ndị bi n'akụkụ ebe ahụ gwara anyị na ọ bụ mgbe ndị otu Ipob maọbụ Massob na-enwe nzụkọ n'ukwu Mango dị ebe a hụ ka ndị uweojii wakporo ha. Gere ya n'uju ebe a: Ndị agha na ndị uweojii juputere ebe ahụ ugbua. Etu Emene dị mgbe mkpamkpa a kpachara" https://www.bbc.com/igbo/afirika-53880815 +sports Coach Supremo Chukwu: 'Anaghị m ele onye amaghị agba bọọlụ anya' Sunday Ogbonnaya Chukwu bụ onye nkuzi bọọlụ ama ama ọfụma n'Enugwu. Ndi dịka Austin Jay-Jay Okocha, Sunday Oliseh, John Utaka na Victor Agali na ndị ọzọ si n'aka ya gafee. Ọgọọst 4 2019 mere otu afọ nwoke a eji 'Coach Supremo' maọbụ 'Jangaza Supremo' mara nwụrụ. BBC Igbo na ya mere mkparịtaụka otu izu ụka tupu ọ nwụo. Ihe o tinyere ọnụ gunyere etu o ji achọpụta ndị bọọlụ nwere akara aka nakwa enyemaka gọọmentị ga-enyere egwuregwu bọolụ. Gee ihe o kwuru n'uju: https://www.bbc.com/igbo/afirika-49218667 +health Covid-19 n'otu nkeji: Akpụrụachịa ọ na-achụ ọrịa coronavirus? Maka ndị na-ekwu na mmanya ọkụ na-achụ coronavirus, kpachapụkwa anya gi o. Mmanya ọkụ anaghị agwọ ọrịa ọbụla ma ya fọkwa coronavirus. Lee ihe nkiri a ka i were anya gị hụ. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Nnamdi Agbanelo na Chukwunaeme Obiejesi https://www.bbc.com/igbo/media-52128137 +business Sign Language: Chijioke Njoku bụ onye ogbu mana ọ b ukwa onye ọkpụ isi Chijioke Njoku bụ onye dara ogbi, mana o kweghị ka ọnọdụ ya butuo mmụọ ya dịka o bidoro kpụwa isi tupu o lee ule Jamb. O kwuru na taa ọ bụ ikpụ isi a na-enye ya na ndị be ya nri maka ego ọ na-enwete na ya. Gere ihe Njoku kwuru kpalitere mmụọ ya ịgbasi mbọ ike agbanyeghị ọnọdụ ya a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-56246783 +entertainment Ebuka: Ndị mmadụ akpụrụla odogwu n'ejiji n'ọnụ ọzọ Akụkọ ndị kachasị mkpa na mgbede a Ebuka Obi-Uchendu onye na-ekwu okwu n'onyonyo ewuwela ọzọ na soshal midia tta. Ndị mmadụ na-ekwu ihe na-atọ ọchị maka ejiji ojiri iji du ndị mmadụ na nturugo ihe onyonyo n'Afrịka taa. Lee ihe o kwuru mgbe o wuru na agbamakwụkwọ Prince Harry na Meghan Markle. Ọzọ, Gọọmentị etiti ekwuola na mba Naịjirịa na mba Chịna ga-ebinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta ga-ebute dọlla nde narị atọ n'ọma maka mmepe obodo. Ebe ego a nke ụlọakụ China Exim ga-ewepụta ga-abanye kachasị nrụpụta ngalaba teknụzụ dị ịcheịche n'ala Naịjirịa. Okwu PVC Dịka Inec kwuru na ha agaghị adọtị oge ha nyere maka ịnata akwụkwọ PVC ndị mmadụ etiele mkpu enyemaka n'Enugu steeti Ha kwuru na ndịọrụ ndenye aha ezughi nakwa na enwere sọsọ otu ụlọọrụ n'ụfọdụ okpuruọchịchị na steeti ahụ nke mere na ndị mmadụ na-emefu oge ebe ha na-eche ị denye aha. Ihe mwute, Onye nọ ebe akụkọ mere gwara ụlọọrụ ntaakụkọ afp na ndị oyindụegwu ji gwongoworo nakwa ngwa agha dị icheiche wakpo ọdọ ndị agha nke ndị na obodo Zari Borno steeti. Ọ kọwara na ha na ndịagha Naịjirịa lụrụ ọgụ ruru otu elekere tupu ha alaghachi azụ Zari bụ obod dị n'oke Niger na Naịjirịa. Na mba ofesi, Barack Obama agwaala ndị mmadụ ha ṅomie John McCain ebe ya na George Bush bụ ndị chịbụrụ mba Amerịka kwanyere John McCain ugwu ikpeazụ n'akwamozu ya. John McCain nwụrụ n'ịzuụka gara aga dịka ọ rịachara ọrịa akpụ nke metụtara ya n'ụbụrụ. N'egwuregwu, Otu egwuregwu Liverpool aghọrọla odogwu dịka ha meriri otu Leicester city ọkpụ abụọ asatara otu mgbe ha zụkọrọ taa. O nweghi onye meriri Liverpool n'etiti Brighton, Crystal Palace nakwa West Ham bụ ndị ha zuterela na mbụ. N'ụtụtụ Kemikal na-ebu ọrịa kansa nọrọ n'ime akwa akwụkwọ - SON Ngalaba na-enyocha ihe a na-emepúta ma ọ dị ezi mma bụ Standards Organisation of Nigeria adọọla ndị na-atụbata akwa ụmụakwụkwọ n'ime Naijiria aka na ntị maka ịtụbatta aa nke nwere otu kemikal na-ebute ọrịa kansa. Ha kwuru na kemikal a dị n'ime akwa ụmụakwụkwọ ụlọọrụ Sing Shun Fat School-Clothier Company na Zenith Uniform Company na-emepụta na China. INEC emechiela odide aha n'akwụkwọ ntuliaka n'afọ a Ngalaba na-ahazị ntuliaka na Naijiria bụ INEC ekwuola na ha agaghị agbati ohere ha nyere ndị mmadụ iji denye aha n'akwụkwọ ntuliaka a kpọrọ PVC n'aha ichafu karịa ụbọchị ha hiwere maka ya. Odeakwụkwọ INEC bụ Rotimi Oyekanmi kwuru na nke a bụ iji nye INEC ohere ịkwadobe ihe niile e kwesiri ime tupu mbido ntuliaka nke 2019 nke ọma. Mana ha ga-alaghachi na inye PVC na ngwụcha yabụ ntuliaka. Vanessa Marquez anwụọla Na mba ofesi, ndị uweojii na Kalifonia nke mba Amerika agbagbuola otu nwaanyị onye ihe nkiri só n' ihe nkiri Ameríka ama ama bụ 'E-R' aha ya bụ Vanessa Marquez. Ha gbagburu Marquez nwere ọrịa isi maka na o chere ndí uwe ojii egbe n'ihu oge ha gara be ya. Serena emeriela Venus N'egwuregwu, Serena Williams emeriela nwanne ya tọrọ ya bụ Venus Williams n'asọmpị US Open. Serena jir agba were banye agba nke anọ n'asọmpị a. Gere akụkọ dị mkpa n'ụtụtụa n'otu nkeji: Abịa n'obodo ndị kacha mma ibi n'ụwa, Sydney, Vancouver, Ọsaka nakwa Toronto so na ndị kacha mma, ebe Legọs, Karachi na Dhaka so na ndị kacha njọ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-45366089 +health Dexamethasone: Gịnị bụ ọgwụ a a sị nwereike ịgwọ coronavirus? "Ndị sayensị chọpụtara na ọgwụ dexamethasone nwere ike inye aka n'ịgwọ ndị bu ọrịa coronavirus. Ndị ọkachamara na mba Briten kwuru na ọgwụ a so n'otu n'ime ọgwụ ndị a na-enyocha, e nwere olileanya na ọ ga-agwọnwu ọrịa a. Mana ọtụtụ mmadụ na-ajụ kedụ ọgwụ bụ dexamethasone na ihe mere e ji sị na o nwereike inye aka n'ịgwọ coronavirus? Otu onye ọkachamara n'ihe banyere ọgwụ ma bụrụkwa otu n'ime ndị ọkachamara n'okwu ọgwụ na West Afrịka bụ Blessing Nwagbara, kọwara ihe ọgwụ a bụ. Gịnị bụ Dexamethasone? Nwagbara sị na dexamethasone bụ otu n'ime ọgwụ ndị ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) kpọrọ ọgwụ dị mkpa kamgbe afọ 1977. Ọ bụ ọgwụ kwesịrị ịnọ n'ụlọọgwụ maọbụ ebe niile a na-ere ọgwụ n'ụwa. O so n'ọgwụ ndị a na-akpọ 'ọzọ Igbo ndụ'. O so n'ọgwụ ndị a kpọrọ 'Corticosteriods' bụ ọgwụ ndị e ji agwọ ọrịa ahụ ọzịza dị iche iche. Ọ bụghị ọgwụ a rụpụtara ọhụrụ, ọ bụ ọgwụ dị kamgbe ọtụtụ afọ. Kedụ ọrịa e ji Dexamethasone agwọ? Ihe e ji Dexamethasone agwọ kpọmkwem bụ ọrịa ahụ ọzịza a kpọrọ 'Edema' na bekee, ọkachasị nke metụtara n'akpịrị nakwa akụkụ ndị e ji eku ume (Brochus). Nke pụtara na e ji ya agwọ ndị nwere ọrịa iku ume Asthma. E ji dexamethasone agwọ ọzịza ahụ nke metụtara ọkpụkụ azụ nakwa nke ụbụrụ. E nwerekwara ike iji ya agwọ ọzịza metụtara anya. Ụdịrị Dexamethasone ole ka e nwere? Nwagbara sị na e nwere dexamethasone dị iche iche nke gụnyere; Nke mkpụrụọgwụ (Tablets), nke a na-agba agba (Injections) nakwa nke a na-atanye n'anya (Eye drop). Ọ sị na ọgwụ a abụghị nke a na-aṅụ otu ugboro ma kwụsị ya, na tupu ị ṅụọ ya maọbụ kwụsị ya na ị ga-anata ntuziaka onye ọrụ ahụike. Gịnị mere e ji sị na o nwereike ịgwọ coronavirus? Nwagbara sị na ihe mere e ji sị na ọgwụ a nwereike inye aka n'ịgwọ coronavirus bụ maka etu o si arụ ọrụ. Dexamethasone na-akwụsị ọzịza n'akpịrị nke na-egbochi onye na-arịa asthma maọbụ ọrịa iku ume ndị ọzọ ka ọ ghara iku ume. N'otu aka ahụ ka a sị na o nwekwara ike inye aka gwọọ coronavirus bụ ọrịa iku ume, ọkachasị n'ahụ ndị o ji aka ọjọọ ji igwe (Ventilator) eku ume. ""Ọ bụrụ na dexamethasone nwere ịke ịkpọpe okpoko ikuku onye na-arịa Asthma, n'otu aka ahụ, o nwekwara ike ịkpọpe nke onye na-arịa coronavirus"". Ọghọm dị n'ịṅụ ọgwụ Dexamethasone Nwagbara kwuru; ""N'agbanyeghi na ọgwụ a juru ebe niile, ọ bụghị ya ga-eme ka mmadụ ṅụọ ya na-enweghi ntuziaka, maka ibute ọghọm"". Ọ sị na ụfọdụ ọghọm dị n'ịṅụ ọgwụ a gụnyere; Ime ka mmiri dọkọrọ mmadụ n'ahụ (Fluid retention) nke nwereike ibute aka ọzịza, ụkwụ na ikpere ọzịza. Oke agụụ ịgụ mmadụ nke mere na ọtụtụ ndị na-achọ ibu ibu na-eji aṅụkarị ya. Ndị ọzọ gụnyere ịra ahụ n'ihi ụra, ịgbọ agbọ, afọ ọsịsa, ike ọgwụgwụ nakwa isi ọwụwa. N'ikpeazụ, Nwagbara sị na ọ ga-adịkwa mma ma ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa ga-enyocha ọgwụ Dexamethasone ma sị ka e were ya na-agwọ Coronavirus. Maka na ọ bụ ọgwụ dị ọnụ ala ma jukwa ebe niile, nke mkpụrụ akarịghị naịra 50 ebe nke ọgbụgba akarịghị 200 naịra." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53075802 +sports Liverpool vs Barcelona: Ngwongwo e jiri mara Barcelona akụwasịala "Lionel Messi a na-etu 'GOAT' tara ahịhịa ndụ taa dịka Liverpool jiri ha hichaa ala ọgbọegwuregwu Anfield. Divock Origi bu ụzọ dọrie neetị ndị Barcelona na nkeji asaa e ji malite ịgba asọmpi a. Georginio Wijnaldum sochiri ya azụ ma gbanye goolu abụọ n'ime nkeji 54 na 56 n'ọkara nke abụọ. Ka a na-ekwu nke a na-ekwu, Origi azaa aha nna ya, ma tụkwasị ya ọzọ na nkeji 79, iji sị Barcelona ""taa! kpuchie ọnụ!"" Lionel Messi na Luis Suarez bụ ndị Barcelona ji eme ọnụ, gbara elu, gbaa ala, mana otu abụghị n'ezi makana Liverpool jidere ha kechie. Cheta na onye ọbụla che na Barcelona ga-egbu Liverpool egbu ka ha ji goolu atọ merie ha n'ụkwụ nke mbụ. Ọkachasị oge ọ pụtara na Mohammed Salah na Roberto Firminho agaghị eso gbaa ya bụ egwuregwu. Mana Liverpool tụgharịrị lie ha na ndụ n'azụ ụlọ ha, gwa ha ""kparịkwaanụ onwe unu"". N'ikpeazụ, Liverpool ji mkpokota goolu (4-3) merie. Ka ọ dị ugbua, Liverpool awụbanyela n'agba ikpeazụ a ga-agba n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Juun. Nke a ga-eme ya afọ abụọ na-eso onwe ha, ha na-agba ikpeazụ asọmpi Champions League." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48179273 +religion Lee etu ndị ekpere Adoration Ground si mee ngagharịiwe taa Ihe onyonyo a na-egosi mgbe ndị gara ekpere Adoration malitere ịme ngagharị iwe n'Enugwu taa. Iwe ha dịka BBC Igbo si chọpụta bụ maka mmachi amachiri ekpere ahụ ma nke ụbọchị ụka, ụbọchị Wenzde nakwa ịmụ anya abalị. Cheta na Bishopu nke Enugwu bụ Bishop Onaga bu ụzọ machie ndị ụka Katọlik niile ị ga-ekpere na nke Fr. Mbaka abalị ole na ole gara aga. Akụkọ bidoro nsogbu a bụ mgbe Mbaka bụrụ Peter Obi ọnụ n'ụka Wenzde ya ọ kara ma kwụọ na ọ gaghị achị Naịjirịa. Mbaka mechara tụgharịa gozie Obi ma rịọ ya mgbaghara dịka ndị mmadụ were iwe malite ịkatọ ya (Mbaka). Nke a bụghị mbụ ụkọchukwu ahụ na-ekwu okwu na-ebute akụkọ gbasara ndị ndọrọndọro. Ndị otu ekpere 'Adoration Ministry' nke onyeisi ya bụ ụkọchukwu Katọlik Ejike Mbaka, amalitela ime ngagharịiwe n'ihi mmachi Bishọpụ Enugwu Dayọsis machiri ụkọchukwu a. Ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ n'ogige ekpere 'Adoration' n'ụtụtụ taa bụ ụka, jirichaa ahịhịa ndụ n'aka ha ma na-eme ngagharịiwe. ọtụtụ n'ime ha na-ekwu na ụka Katọlik n'Enugwu steeti enweghị Bishọpụ. Akụkọ na-abịa. https://www.bbc.com/igbo/articles/cd19grk42zxo +religion St Valentine's Day: Akụkọ St Valentine bu akụkọ ifo - Ụkọchukwu Katọlik "Ụbọchị Valentine bụ ụbọchị eji egosi ịhụnanya ọkachasị n'etiti nwoke na nwaanyị. Ọtụtụ ndị na-eji onyinye maọbụ were ihe na-acha ọcha maọbụ ihe na-acha mme mme echeta ya bụ ụbọchị. Anyị na Chika Okpalike Ụkọchukwu na ọkammụta n'African Traditional Religion' tinyere anyị ọnụ na ya bụ okwu. Chika Okpalike kwuru na akụkọ maka Saint Valentine dịka nkọmịrịkọ na nkọkịrịkọ nke bekee nwereike ịkpọ Myth maọbụ Legend. Nke a pụtara na-enweghị ihe a na-atụzịrị aka were sị maọbụ eziokwu maọbụ asị. Kama o kwuru na a na-anabata ya site n'okwukwe na ọ bụ etu o siri mee. Okpalike kwuru na enwere ọtụtụ akụko maka onye bụ Saint Valentine kama ọ bụ abụọ ka ndị mmadụ kacha akọ. Okpalike gwara anyị na ụfọdụ na-akọ na Saint Valentine bụ nwa okorobịa bụ onye nke Kraịst ejidere ka egbuo n'oge ihe dịka 4th century. Ọ kọwara sị "" kama oge ahụ nwa onye ọchichị bụ Emperor nọ n'ọrịa mana Valentine kpere ekpere were gwọọ nwatakịri ahụ ọrịa ya"". O kwuru na akụkọ ga-kwara n'ihu sị na mgbe Valentine gara ị nara ikpe ọnwụ ya, ọ dere nwatakịrị agbọha ahụ akwụkwọ ozi iji kosi ya na ya hụrụ ya n'anya. Chika Okpalike kọwara na-enwere akụkọ ọzọ bụkwa na-enwere Saint Valentine ọzọ onye ụkọchukwu na-agba ndị agha akwụkwọ oge Rome nọ n'ọchịchị ebe dị ukwu. Okpalike kwuru sị, "" Saint Valentine na-agba ndị agha akwụkwọ na nzuzo n'ihi na gọọmentị Rome akwadoghị ndị agha ha ịgba akwụkwọ oge ahụ"". O kwuru na ọ mere nke a amaka ihunanya ọ na-ahụ n'etiti ndị a. Akụkọ ndị a na ndị ọzọ bụ nkọmịrịkọ na nkọkịrịkọ Mmeme ochie nwereike ị bụ ebe emume valentine siri bido Emume Lupercalia: Okpalike kọwara na nke a abụ mmemme ndị Rome na-eme oge gboo. Okplaike kwuru sị, "" Aha Lupercalia sitere n'okwu latin abụọ nke otu n'ime ya bụ Lupus"". O kwuru na Lupus pụtara nkịta ọhịa nke bụ Wolf n'okwu bekee. Ọ kọwara sị, ""Rome oge gboo na-eche na ọ bụ Lupus a zụlịtere ndị chọpụtara mba Rome aha ha bụ Romulus na Remus"". Kama Okpalike kọwara na nyocha agba ọhụrụ na-egosi na Wolf nereike ị bụ ụkpụrụ ezoro ezo nke bụ Code n'okwu bekee. Ọ sị, ""Lupus a pụtara onye akwụnakwụna n'ụzọ ụkpụrụ zoro ezo bụ code"". O kwuru na ihe nke a pụtara n'akụko Lupus nwereike ị bụ na ọ bụ ndị akwụnakwụna zụlitere mmadụ abụọ a chọtara mba Rome. Okpalike kọwara na Lupercalia bụ mmemme ndị Rome na-eme n'ọnwa Febuwarị iji cheta ihụnanya nkịta ọhịa a gosiri Romulus na Remus ndị ha si chọtara mba ha. Okpalike kwuru sị, ""Ọ na-adanye karị sitye n'ime ụbọchị iri na atọ ruo ụbọchị iri na ise nke Febuwarị"". O kwuru sị, ""Ọ bụ chị ha na-efe maka ọmụmu (Fertility) na chi ha na-efe maka ahụike ha ka ha na-emere mmemme a"". Okpalike kwuru na a na-eji uhie ọcha nke pụtara ị dị ọcha na uhie mmemme eme emume Lupercalia mgbe ochie. Ndị BBC depụtara na emume Saint Valentine danyere n'oge eji echeta ọmụmụ na ihunanya ma gụnye kwa na ọ bụ kwa oge a na-echeta chi Zeus na Hera. Okpalike kọwara na ""Februa bụ aha ụtali esi n'akpụkpa ewu emepụta"". O kwuru na a ụmu nwoke na-eji ya bụ Februa apịatụ ụmụ nwaanyị ndị na-achọ nwa , Ha na-eche kwa na nwa okoroọbịa were ụtalị metụ nwaanyị n'ahụ na nwaanyị ahụ ga-ahụ ya n'anya. Etu Cupid siri bata emume Valentine Okpalike kọwara na Cupid bụ chi Ịhụnanya ndị Greek. Okpalike kọrọ akụko were sị, ""Cupid hụrụ chi ha ọzọ aha ya bụ Apollos n'anya"". O kwuru na akụkọ na-ekwu na Cupid gbara Apollos ụta n'obi ka ọ were hụ ya n'anya. Nke mere na ọtụtụ kwenyere na ọbara si na obi Apollo pụta gosiri ịhụnanya ọ bụ ya mmere eji uwe na ihe na-acha mmemme eme emume Saitn Valentine. Ọ bụ ya mere iji ahụkarị obi na-acha mme mme maọbụ onye ji ụta agba na ya bu obi. Chika Okpalike kọwara na ọ bụ bụ pope Galacius nke mbụ bụ onye bidoro mmemme Saint Valentine n'afọ 496 AD. ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Pope Gelacius wetara emume Lupercalia were nke Saitn Valentine dochie ya. Kama enweghị kwa ihe a ga-eji kwado na ya bụ ihe bụ eziokwu. Kedụ ụka ndị na-eme emume Saint Valentine. Ndị ụka nke CMS bu Angịkan, ndị orthodox na ndị nke Luther na-eme emume Valentine. Ọ bụ emume ncheta Saint Cyril ma Saint Methodius ka ndị ụka katọlịk na-eme. Na-agbanyeghị na Saint Valentine nọ na Kalenda ndị Saint a na-echeta n'ụbọchị ahụ, ndị ụka katọlika anaghị eme mmemme Saint Valentine n'ụbọchị ahụ. Ọkammụta Okpalike kwuru na ugbụa ị ga-ahụta emume ndị Rome ochie ma hụta kwa emume ndị nke Kraịst n'oge valentine ugbua. Okpalike kwuru ma kwusie ya ike were sị na okpukpere chi nke Kraịst anaghị akwado ịhụnanya mmekọrịta ma ọ bụghị n'etiti di na nwunye. O kwuru sị, "" Ugbua, ihe a na-eme bụ mmekọrịta ihunanya ma nke ụka kraịst na-akwado bụ mgbe nwoke na nwaanyị lụrụ onwe ha"". Kama onye ụkochukwu Katolịk ọzo nke ngalaba Dominican bụ Felix Udolisa kwuru na emume Valentine bụ emume eji echeta ịhụnanya. Udolisa kọwara sị, ""na-agbanyeghị na ọtụtu na-eji ya echeta ihụnanya nke mmekọrịta ahụ, ọkachasị n'etiti ndị ntoroọbịa. E nwere ike iji oge emume valentine kuziere ndị ntorobia ihe bụ ihunanya"". Ọ kọwara na ndị ntorobia a ga-emecha bụrụ nne ma o bụ nna nke mere na ọ ga-ebido n'oge kuziere ha maka ihunanya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56033310 +health Covid-19: Ihe ala ili na-egosi maka coronavirus na Somalia Ndị dọkịnta abụọ na-azọ ndụ ha a Mogadishu bụ Isi Obodo Somalia ekwuola etu ha si alụso ọrịa coronavirus agha. Akụkọ kwu kwara maka nke bụ eziokwu na ọnụ ọgụgụ gọọmentị mba ahụ na-ewepụta maka ọrịa covid-19. https://www.bbc.com/igbo/afirika-53551244 +politics Hope Uzodinma adịghị ege m ntị unu etịkọzịna aha anyị - Fada Mbaka "Fada Ejike Mbaka bụ onye ọtụtụ mmadụ na-ahụta dịka onye aka ya dị n'oche Hope Uzodinma nọ ugbua dịka aka na-achị Imo steeti, kwuru na kemgbe o rigoro n'ọchịchị, ọ naghị aza ekwentị ya ma ọ kpọọ ya. Mbaka sị ka ndị mmadụ ghara ịkpọ aha ya ma ha kpọwa aha Uzodinma makana kemgbe o nwere mmeri, ọ laghachiteghi ụlọụka ya bịa nye Chukwu ekele. ""Ọ bụghị na m na-arịọ ya ego, ọ bụ ka m were nye ya ndụmọdụ maka ọchịchị ọma."" Ọ gakwara n'ihu kwuo na Imo steeti nọ n'ọnọdụ ọjọọ, dịka o kwuru na steeti ahụ na-achọzị omimi. Lee ihe ọzọ Mbaka kwuru n'onyonyo a." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56893981 +health Coronavirus tips: 'Anambra bidoro kemgbe ọnwa Jenụwarị kwadobe maka Coronavirus' - nnochite anya kọmịshọna "Simeon Onyemaechi nọchitere anya Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike n'Anambra steeti gwara BBC Igbo etu steeti ya si kwadote maka ọrịa Coronavirus. 1. Sayensị na-eme mgbanwe Iji maa atụ o kwuru na n'izuụka ole na ole gara, a dọrọ ndị mmadụ aka na ntị maka ikpu ""Facemask"" Mana ugbua ihe atụgharịala a na-asịzi ndị mmadụ jiri ya kpuchie ihu ha mana ekputenaghị ya aka. Ugbua ekwuola na mmadụ niile nwereike ịkpu. 2. O nweghi ihe jikọrọ 5G na ọrịa Coronavirus Ọ bụ teknụzụ ọhụrụ nwereike ịbu radiation nke ga-eme ka ahụike mmadụ kụọ akụ nke ga-eme ka mmadụ nwụọ site n'ọrịa. ọ bụghị na ọ bụ ya na-ebute ọrịa Coronavirus na nke ahụ bụ nghọtahie. 3.Etu Anambra si kwadote ugbua Lee ihe ndị Dọkịta Onyemaechi kwuru maka nkwado Anambra steeti: Ebe ọgwụgwọ ICU nwere akwa na ventilator isii Ebe ọgwụgwọ ọzọ nwere akwa narị abụọ na ọma iri anọ na Mbaukwu. Anambra agaghị eche ka ọrịa Coronavirus bata tupu ha kwadobe. Ịkụziri ndị na-azụ ahịa maka ịkwọ aka na idebe akụkụ ha ọcha nakwa ịkuziri ndị na-agba ụgbọala njem maka ndị mmadụ ịnye ibe ha efe nke Bekee kpọrọ ""social distancing"". Onyemaechi kwuru na atụmatụ ndị a gosiri na ihe ka Anambra steeti mkpa bụ igbochi ọrịa a karịa ���gwọ ya agwọ. 4.Anambara a ga-enwe ụlọ nyocha nke ya? N'ịza ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ gbasara Anambra ịnwe ebe nyocha nke ya n'ime steeti, Kọmịshọna ahụ kwukwara na Gọvano Willie Obiano na-agba mbọ ịhụ na nke a mezuru. O kwuru na onyeisi NCDC kọwara na e nwere usoro esi enweta ebe nyocha na ọ bụghị gọọmentị steeti ahụ ka ọ dị n'aka. O kwukwara na n'agbanyeghị nke a, steeti Anambra ebidola usoro ahụ nke ga-eme na n'oge adịghị anya ọ ga-abịa n'Anambra steeti. Dịka ọ dị ugbua, Kọmịshọna ahụ kọwara na nyocha niile a na-eme bụ na Irrua dị n'Edo steeti ka a na-eme ya. 5.Coronavirus abụghị ọrịa ndị ọgaranya Na ngwụcha mkparịtaụka, Dkt Onyemaechi kwuru na ndị mmadụ echekwana na ọrịa a bụ ọrịa ndị ọgaranya. O kwukwara na mgbochi ọrịa ka ọgwụgwọ ya ma jirikwa ohere ahụ na-adọ aka na ntị ka ndị mmadụ kwọ aka ha, nye ibe ohere ma nọrọkwa n'ụlọ iji hụ na ọrịa ndị a efesaghi. O kwuru na ihe ga-enyere ndị mmadụ aka bụ ịnwulite ahụike ha dịrị nkwadobe ma na-arị ọ chukwu ka ọrịa ahụ ghara ịbata n'Anambra steeti." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52165481 +business Aba-Port Harcourt Express Way: Ihe mere ndị ọkwọ ụgbọala ji gbachie okporoụzọ a Ndị ọgwọ ụgbọala ukwu dịka Tanka, gwongworo na ndị ọzọ emeela ngagharịiwe ma gbachie ụzọ awarawa si Aba gawa Pọtakọtụ kamgbe ihe dị ka otu izuụka. Ha kwuru na isi iwe ha bụ maka ọndọdụ ọjọọ okporoụzọ ahụ, ọkachasị na mpaghara Aba gawa Pọtakọt bụ nke ha sị na-emebisi ụgbọala ha. N’ihi ngagharịiwe a, ọtụtụ ndị na-eme njem n’okporoụzọ ahụ na-ata ahụhụ ugbua maka ụzọ agaghị aga. Otu n’ime onye ọkwọụgbọala bụ Ikechukwu gwara BBC Igbo na “Ọ bụ n’ihi ụzọ adịghị mma mere anyị ji were ụgbọala anyị kwuchie ụzọ n’ime ngagharịiwe. “ọkpọrọụzọ ọjọọ a emebichaala ụgbọala anyị ma gbuokwa ọtụtụ ndị ọkwọ ụgbọala site n’ihe mberede okporoụzọ. “Ihe ọzọ anyị ji na-eme ngagharịiwe bụ etu ndị ọrụ nchekaa ji ana anyị ego n’okporoụzọ a na-agbanyeghi na ọ dịghị mma.” Onye ọkwọ ụgbọala ọzọ kwuru na ọnọdụ ha ka njo site n’iwu Gọọmentị Abia tinyere nke sị ka ndị ọkwọ ụgbọala Tanka abatala Aba ruo mgbe ọ kụrụ elekere iri nke abalị (10pm). Ọ gara n’ihu kwuo na ndị ọrụ ọtawaike Gọọmentị na-ana ha ụtụisi n’aha Gọọmentị ruchaa ihe dị ka elekere iri na abụọ nke etiti abalị (12am) Kamgbe ha bidoro ngagharịiwe a, BBC Igbo chọpụtara na ọ naghị izi adị mfe ime njem e si Aba gawa -Pọtakọt. Ndị ọkwa ụgbọala a gbara isiakwara na ha agaghị emepe ụzọ a ma ọ bụrụ na Gọọmentị Abia Steeti abịaghị leba anya n'iwe ha. BBC Igbo gbara mbọ ịkpọtụrụ kọmishọna mgbasaozi nke Abia Steetị bụ Eze Chikamnayo mana ọ zaghị ekwentị ya. Kepukepu kwuru na Gọọmentị Abia Steeti gbasara ozi ozi n'igwe redio ma gwa ndị ọkwọ ụgbọala ndị a ka ha si n'okporoụzọ ahụ pụọ. https://www.bbc.com/igbo/articles/ckk2k0wgzyxo +business Abacha loot: Nna m gaara azara ọnụ ya n'ebubo izu ego ma ọ bụrụ na ọ dị ndụ Sadiq Abacha bụ nwa ọchịagha Sani Abacha chiburu Naịjirịa etinye ọnụ n'okwu banyere ọchịchị nna ya chịrị Naịjirịa. Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, ọ sị na ndị nọ n'ọchịchị n'oge nna ya na-achị Naịjirịa maara na ọ bụghị ozuzu ka nna ya zuru ego ndị a, kama na ọ bụ maka iji mee ihe ndị ọzọ. Ọ sị na ọ bụrụ na nna ya dị ndụ, na ọ gaara azara ọnụ ya banyere ebubo izu ego ndị Naịjirịa. Sadiq gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa chọrọ ịma nke bụ eziokwu na ha mee nyocha. O kwukwara na ọchịchị nna ya bụ ọchịchị zuru onye ọbụla ọnụ, nke bụ onye ukwu rie, onye nta rie. Kirie ihe o kwuru n'uju; Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-53029619 +politics Guinea Bissau: Buhari enyela mba a $500,000 maka ntuliaka ha Akụkọ ndị dị mkpa: Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari enyela mba Guinea Bissau puku nari ise dọla na akọrọngwa ndị ọzọ iji kwado ntuliaka ha. Akọrọngwa ndị ahụ gụnyere ngwongworo abụọ, ụgbọala Hilux ise, ọgbatumtum iri, bụ iji kwado ntuliaka maka ọkwa ndị omeiwu nke mba ahụ. N'ozi ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garba Shehu wepụtara, enyemaka ahụ bụ n'ọsịsa nye mbeku nke gọọmenti mba Guinea Bissau bekuru ya. Mba Guinea Bissau bụ mba dị n'ọdịda-anyanwụ Afrika nke ndị Pọtụgizi chịrị tupu ha nwe nnwereonwe n'afọ 1973. Dịka CIA World Factbook siri depụta ya na webụsait ha, Guinea Bissau nwere okpukperechi dị icheiche gụnyere ndị ụka Alakụba( pasentị 45) ndị ụka Kraisti (pasentị 22) Christians, na ndị ụka ọdịnala dị (pasent 414.9) Onyeisi otu jikọtara ndị ọrụ bụ Ayuba Waba kwuru na onye ọbụla nwere ndị ọrụ karịrị iri abụọ na ise ga-eso ndị gọọmentị na-akwụ ụgwọ a. Waba kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ụlọ ntaakụkọ Channel TV nwere taa. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị ndị na-arụrụ goomentị ọrụ ka a na-akwụ ụgwọ opekatampe puku naịra iri atọ. Onyeisi ndị oyi ndụ egwu wakporo mba Sri Lanka n'ụbọchị Easter so nwụọ n'ime mwakpọ ahụ ha mere. Nwa amadị a akpọrọ Zahran Hashim nwụrụ n'ụlọ ndịna Shangri-La bụ nke so n'ebe ha wakporo. Nna onye ọgba bọọlụ bụ Emiliano Sala, nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu e soro nwa ya nwụọ dịka ọnwa atọ gachara. Heracio Sala gbara afọ iri ise na asatọ nwụrụ n'ụbọchị Fraịde abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Eprelụ 2019 n'ihi obi nkolopu. Gọọmenti Kaduna steeti amachiela ngagharị n'okpuru ọchịchị Kajuru dị na steeti ahụ ka e gbuchara mmadụ atọ ma mụnye otu obodo ọkụ. Kajuru nọ n'ọgbaghara na nso nso dịka akụkọ gbu,gbuo gbuo si ebe ahụ apụta. Mana o bidoro na-ede jiji kemgbe Tọzde ka a hụchara ozu otu nwa Awụsa n'ime olulu. Iji bọrọ ọnwụ nwanwoke ahụ, ụmụ ndị Awụsa gara wakpo ụmụaka ndị Adara abụọ ka ha na-alọta ahịa tie ha, e bugara otu n'ụlọgwụ , ọ nwụọ n'ụtụtụ taa bụ Fraide. Nke a kpalitere egwu nke na ndị ọrụ nchekwa nwujuru ebe niile na mpaghara ahụ. Otu ụlọikpe dị na mba Amerịka amaala otu nwaayị onye ocha ikpe ohi maka ji aghụghọ anapụta ndị mmadụ ego were ebi ndụ alabanko. Anna Sorokin, onye na-agwa ndị mmadụ na ya bụ nwa ọgaranya na-ekpori ndụ n'ụlọoriri na nkwarị kacha oke ọnụ ahịa ma na- agba ụgbọelu ndị enyị ya, ndị ụlọakụ na ụlọọrụ ndị kwenyere na ụgha ya kwụrụ ụgwọ ya. Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige agọọla ụkwụ n'aka ya na ihe a sị na ya kwuru maka ndị dọkịta abụghị etu ya siri kwuo ya. O kwuru ka ihe ya kwuru bụ na ndị dọkịta anaghị enwe ohere ọzụzụ na Naijiria nke mere ha ji aga alabekee maka ịgụwanye akwụkwọ iji bụrụ ọkaibe n'ọrụ ha nke bụ ihe ọma nyere Naijiria dịka ha na-ezilata ego na ihe ha mụtara n'ala bekee.Gọọmenti etiti etinyele ego na nchekwa agbata ya mba ndị ọzọ. Gọọmenti etiti ebinyela aka n'akwụkwọ ijeri dola iri ise na abụọ bụ ego a mapụtara maka iji teknụzụ echekwa agbata Naijiria na mba ndị ọzọ. Ọ bụ Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo bu onye mere nke a na nzuko ya na ndị imeobi gọọmenti mere ụbọchị Tọzde. Ikwu megide agbụrụ Ndigbo na Yoroba bụ otu afọ mụrụ - Oba Ogunwusi Adeyeye N'egwuregwu, Raheem Sterling bụ onye egwu Manchester City eritela nturuugo maka ikwugide ịkpa oke agbụrụ nke BT Sport Industry Awards nyere ya ụbọchị Tọzde. https://www.bbc.com/igbo/48063344 +health Covid-19: 'Ọ bụ n'ọnụ onyeisiala ka m nụrụ na m bụ ọrịa coronavirus' "Sita Tyasutami na nne ya Maria Darmaningsih bụ mmadụ abụọ bu ụzọ bute ọrịa coronavirus na mba Indonesia. Kama ihe mere ka ọnọdụ ha pụọ iche bụ etu ha siri mata na ha bu ya bụ ọrịa. Nne na nwa gara ụlọọgwụ dịka ha na-egosi njirimara ọria coronavirus ma na-eche ka agwa ha mpụta nnyocha emere ha. Kama ọ bụ mgbe ha na-ele ihe onyonyo oge Onyeisiala Indonesia bụ Joko Widodo na-agwa ndị mba ahụ okwu ka ha matara na ha bu ọrịa coronavirus. Onyeisiala Widodo kwuru na mgbasa ozi ya were sị na Indonesia enwetela mmadụ abụọ mbụ bu ọrịa coronavirus. Widod kpọrọ afọ ole ndị ahụ dị, ụlọ ọgwụ ha nọ na ndị ha na ha nwere mmekọ. Akpataoyi wụrụ Tyasutami n'ahụ dịka ọ chọpụtara na ọ bụ ya na nne ya ka onyeisiala na-ekwu maka ya. O wutere ya na ọ bụ n'ihe onyonyo, site n'ọnụ onyeisiala ha ka ha ga-eji mara na ha bu ọrịa coronavirus. Mgbe olu bidoro ịkọ Sita ọkọ, o nweghị ihe ọ kpọrọ ya tupu ya eruo ụtụtụ ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Febuwarị mgbe ahụ ya biara mesiwa ya ike. Nne ya bụ Darmaningsih na-arụ ọrụ dịka onye nkuzi na Mahadum ndị na-agba egwu dị na Jarkarta, dakawra ọrịa ma ha abụo amaghị ihe na-eme ha. Ha gara ụlọọgwụ ebe dọkinta gwara Tyasutami na ọ nwere ọrịa ""Typhus"" ebe nne ya nwere ""Broncopneumonia"". Ha gwara ndị ụlọọgwụ ka ha mee ha nnyocha maka coronavirus kama ndị ụlọọgwụ jụrụ n'ihi na ha enweghị akụrụngwa e ji eme nnyocha. Ọ bụ n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Febuarị mgbe otu enyi Tyasutami gbara ya ama na ya bụ Tyasutami gara otu ọgbakọ ndị egwu ebe otu nwaanyị si mba Japan bụ ọria coronavirus biakwara. Mgbe ahụ ka Tyasutami matara na agwọ nọ n'akịrịka. Tyasutami kwuru sị ""ugbua ka m siri ọnwụ were gwa dọkinta ka ha nnyochaa anyị maka coronavirus"". Dọkịnta kwetara ugbua ma edopụkwara ha iche n'ụlọọgwụ pụrụiche maka ndị bu nje. Ọ tụrụ Tyasutami na nne ya Darmaningish n'anya na ọ bụ n'ọnụ onyeisiala ka ha ji mara na ha bu ọrịa coronavirus. Ọ bụ mgbe abalị abụọ gara ka a gwara Tyasutami na Darmaningish na iwu obodo Indonesia nke ehiwere n'afọ 2009 na-ekwu na mgbe ọbụla e nwere ọrịa zuru ụwa ọnụ, na ọ bụ onyeisiala ka a ga-ebu ụzọ gwa. Kama ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị mba Indonesia bụ Achmad Yurianto gwara BBC na ọ bụ etu a ka iwu ha dị. N'aka nke ọzọ nwanne Tyasutami bụ Ratri Anindyajati kwuru sị "" ndị mmadu na-ata nwanne m ụta na ọ bụ ya butere ọrịa a na mba anyị, ọtụtụ na-ata kwa ya ụta na ọ bụ ya mere e jiri chụọ ha n'ọrụ"". Dịka onyeisiala kwuchara okwu ya, mkpọbịrị aha Tyasutami na nne ya, akara ụlọ ha ma ihe gbasara ahụike ha jupụtara na ""Whatsapp"". Tyasutami kwuru sị ""tupu m bute ọrịa coronavirus, enweghị onye na-agwa m okwu ọjụọ, mmadụ puku abụọ na-eso m n'Instagram ma ugbu a ha eruola mmadụ puku iri. Ndị mmadụ na-ekwu zi okwu na ihe onyonyo ebe m yi mbeleukwu m ji agba egwu"" Ratri Anindyajati bidoro igosi njirimara ọrịa coronavirus nke mere ka ọ gaa kwa nnyocha. Mpụta nnyocha ya gosikwara na o butela ya bụ ọrịa Ntule Richard Mckay bụ Ọkammụta na onyenkụzị ihe gbasara mbido ọrịa zuru ụwa ọnụ Mckay kọwara na ịkpọ mmadụ ""Patient Zero"" maọbụ onye mbụ bu ụzọ bute ọrịa zuru ụwa ọnụ na-eduhe karị ndị mmadụ. O kwuru na a na-enwekarị ndị ga-ebu ya bụ ọrịa ma ọ gaghị egosi n'ahụ ha. Mckay kọwara na-ịkpọ mmadụ onye mbụ butere ọrịa dịka coronavirus na ebute kwa ịkpa oke na ịkwa emu. Ọ kọwa kwara na ọtụtụ mgbe, gọọmentị agaghị etinye ụchụ ị chọpụta ndị ọzọ bu ya bụ ọrịa a dika ha ga-etinye uche ha niile na ndị mbụ ha chọpụtara maọbụ ndị a na-akpọ ""Patient Zero"". Dịka ọ dị ugbua, Tyasutami, Anindyajati na nne ha bụ Darmaningish enwerela onwe ha. Ụfọdụ na-akọ ha ọnụ, akpọ ha ekwensu kama Anindyajati sị "" anyị kwetere na enwere ndị ọzọ bu ya bụ ọrịa ma ewepụ anyị, kama ma enweghị ihe ọzọ, nchọpụta nke anyi mere ka gọọmentị bido iluso coronavirus ọgụ"". Ụgbụ a,mba Indonesia enwela mmadụ puku iri na abụọ bu ọrịa coronavirus ebe mmadụ narị itolu anwụọla site n'aka ya bụ ọrịa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52559972 +health Kidney problems: Iri oke nnu,ọgwụ ahụ mgbu, mmanya ọkụ na ihe ndị ọzọ nwereike ikotere gị ọrịa 'kidney' "Ọrịa akịrị na-arịzi elu ugbua na Naijiria. Ọtụtụ ndị ama ama anwụọla, ebe ụfọdụ ndị ọzọ gunyere onye otiegwu ụka na-ewu ewu nwụrụ na nso nso a site n'ọrịa akịrị. Dịka ndị ọkacharmara ahụike akịrị (neprologists) si kọwaa, ihe ruru nde mmadụ iri abụọ na ise (25m) na Naijria nwere ọrịa ndakpọ akịrị. Ọrịa akịrị na-adapụtakarị n'ọrịa shuga, ọbaramgalielu; na-eri nnukwu ego ọgwụgwọ ma na-atakwa onye ọ na-arịa ahụhụ ebe ọ dị ukwuu. Mana ị nwere ike ịgbalahụ ya site na izere ụdị ndụ na-akpalite ya. Dọkịta Ifeoma Ulasi bụ ọkammụta ahụike akịrị nakwa onye nkuzi na mahadum'College of Medicine, University of Nigeria, Enugu,kọwara ụdị agwa na-etinye ọtụtụ na nsogbu akịrị. Lee ụfọdụ n'ime ha: Iri oke nnu na-ebute ọbaramgbalielu nke nwere ike imebi akịrị. Dkta Ụlasị kwuru: ""Nri anyị na-eri ekwesịghị ka nnu gafe maọbụ tụọ na ya."" ""Nnụ na-enye anyị bụ ndị ojii nsogbu maka na mbụ mbụ, ndị nnanna anyị ha nọ ya, anyị enwekebeghị nnu nke mere ka obere nnu mara ahụ anya ahụ anyị. Ya mere,anyị rie obere nnu, ọ zuoro ahụ anyị."" ""Nnụ karịa n'ahụ anyị o mewe BP ọ rụwa, ụfọdụ enwewa ọbaramgbalielu."". Ịṅụ mmanya na-egbu egbu na-emetụ ahụike akịrị. Nwantịtị ahụmgbu maọbụ isiọwụwa, ịkponye ọgwụ n'ọnụ na-ajụghị dọkịta ese. Ị ma na ị jji aka gị eguru onwe gị olulu nsogbu akịrị? Dịka ndị ọkachasị mara ọgwụ ahụ mgbu na-emerụ akịrị ahụ. Nri ndị Bekee dịka nri mkpọ na nke e ji ntụ ọka were mee nke Bekee kpọrọ 'junk foods' na-amasị ndị mmadụ ọkachasị ndị na-eto eto mana ọ bụ nsi nye akịrị. Dkta Ulasi: ""Ụdị nrị ndị be anyị na-eribu dịka ụdị osikapa, ji, akpụ,garị akwụkwọnri nwere faiba nke mere na ọ bụghị ihe nile dị na nri ahụ ga-abanye gị n'ahụ. ""Mana ugbua, anyị na-erizi nri ndịọcha dịka flọọ na shuga nke ihe niile ga-abanye gị n'ahụ."" O kwuru na ihe ndị a mere na a na-arịazi ọbaramgbalielu,ọrịa shuga,oke ibu(obesity) bụ nke ��� rụtụụ aka na-emebi akịrị. Oke ịnọ otu ebe, na emegharịghị ahụ na-ebutekwa nsogbu akịrị dịka ọ na-enye ohere ka ọrịa nwere ike ibute ọrịa akịrị n'ahụ mmadụ. ""Ndị mmadụ anaghị agbakiri ala, megharị ahụ. ụgbọala adịla ebe ọbụla, ndị mmadụ na-aga ha e jiri ụgbọala."" Dọkịta Ulasị nyere ndụmọdụ sị, ""Ọ bụghị iwu na onye ọbụla ga-aganwu 'gym' , i nwere ike imegharị ahụ site na iji ụkwụ na-agharị, na-eje ọrụ maọbụ ejegharị."" Araghụghị ụra ọfụma, dịka Dkta Ulasi siri kọwa na-emetụta ọbara mgbalielu. ""A na-arahụ ụra, ọbara na-agbatụ ọfụma were nye ike ka ahụ igị, mobi gị naafụ ọbara zuo ike."" Ịghụ sịga na-emetụta akịrị n'ụzọ jọrọ njọ nke ukwu. Ụlasị kọwara na,""sịga na-atakụtọ n'akịrị, mebie akịrị.""`Anaghị aṅụ mmiri ọfụma. Ndị dọkịta Bekee na-akọwa n'ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpọakwụkwọ na-emerụ akịrị ahụ n'ụzọ puruiche. Kedụ ihe kpatara nke a? Ọtụtụ ọgwụ Igbo bụ ka o si sọ onye ka na-anwụ ya. E nweghị ntụzịaka ole onye ga-aṅụ. Ụfọdụ otu ọnụ na-agwọ nnụ ọrịa.Dkta Ulasị kọwara sị, ""Ihe ndị e ji eme ọgwụ Igbo ụfọdụ na-egbu akịrị."" Ndị okwu ahụike doro anya na-akọwakwa na iri nrị e si mba ofesi tụbata na-ebutekwa ọrịa akịrị. Ụfọdụ nri e si mba Chaịna were kemikal e ji chekwa ya nke na-emebi ihe dị mkpa n'ahụ. Dika Ulasi si na nkea bụ eziokwu. ""Ụfọdụ nrị esi mba ofesi nwere nnu na phosphorus karia etu ahụ chọrọ.""" https://www.bbc.com/igbo/60873883 +religion Omega Power Ministry: 'Ndị ọzụzụ atụrụ ekwesịghị iri atụrụ etinyere ha n'aka' "Chibuzor Chinyere bụ onyendu Omega Power Ministry a ma dịka OPM, adụọla ndị ụkọchukwu ọdụ gbasara etu ha na ndị nso ha kwesịrị ị na-eme ka ọrụ Chukwu na-aga ọfụma. N'okwu ọ gwara BBC Igbo maka ndị ụkọchukwu a na-ebo ebubo iwakpo ndị mmadụ n'ike, Chibuzor kwuru na omume ahụ adịghị mma. Ọ kọwara ya dịka ""onye ọzụzụ atụrụ iri atụrụ e tinyere ya n'aka"". Gere ihe ndị ọzọ o kwuru maka ya ebe a. Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho, Nnamdi Kelechi Agbanelo" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48840558 +politics Anambra Election Update: Obiano tụkwasara osote ya bụ Nkem Okeke obi nke ukwu, mana ọ gharịpụla ya - Victor Oye "Onyeisioche pati APGA bụ Victor Ike Oye ekwuola na obi adịghị ya mma etu osote Gọvanọ Anambra steeti bụ Nkem Okeke si hapụ APGA wụfee APC. Oye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Channels TV na mgbede Tọzde. O kwuru na onweghị ihe ọbụla na-esere Gọvanọ Willie Obiano na osote ya bụ Okeke. ""Obiano kpasoro Nkem Okeke agwa ọma, onweghị ihe kọrọ ya ụkọ,"" Oye kwuru. ""Onweghị nghọtahie ọbụla dị n'etiti ha abụọ. Onweghị onye mere ya ihe ọjọọ. Onweghị ụgwọ ọbụla e ji ya."" ""Gọvanọ Obiano tụkwasara ya obi nke ukwu, ọ bụ ihe ọjọọ etu Nkem Okeke si gharịpụ Obiano ugbua."" Oye chetara oge Nkem Okeke mere akwamozu nna ya, nakwa etu o si kelee Gọvanọ Obiano maka enyemaka niile o nyeere ya. Ọ gara n'ihu kwuo na ya ma na Nkem Okeke ga na-akwa ngaramara maka ịhapụ APGA baa APC, n'ihi na onweghị ihe a ga-eji ya kpọrọ n'ebe ahụ.. Akụkọ na-efegharị ugbua na-ekwu na osote Gọvanọ Anambra steeti bụ Nkem Okeke ahapụla pati 'All Progressive Grand Alliance (APGA) banye 'All Progressives Congress (APC). Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma duuru Dkt Nkem Okeke gaa hụ Onyeisiala Muhammadu Buhari n'Abuja taa bụ Wenezde. Ọ bụ onye enyemaka mgbasaozi Buhari bụ Bashir Ahmad wepụtara ozi a n'ehihie taa. Oge BBC Igbo kpọrọ Okelo Madukaife, bụ ọnụ na-ekwuru pati APC n'Anambra, o kwuru na ""ebe ọ bụ na ọnụ na-ekwuru onyeisiala ekwuola ya, werenụ ya na ọ bụ eziokwu."" Nke a na-abịa dịka ọ fọrọ naanị ụbọchị olemole tupu ụbọchị ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti eruo. N'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba ka ntuliaka ahụ ga-adị. Nke a bụghị nke mbụ ndị welitere isi na pati APGA na-awụfe APC. Cheta na ndị omeiwu isii n'Anambra steeti wụfere na APC n'ọdị nso a. Ha gụnyere Nonso Okafor, Timothy Ifedioramma, na Cater Umeoduagu. Ndị ọzọ bụ Lawrence Ezeudu, Arthur Chiekwu, na Edward Ibuzo. N'izuụka gara aga, Gọvanọ Willie Obiano kwuru na nadị niile na-esi n'APGA abanye APC n'Anambra steeti bụcha ozi ka ha na-agara APGA. O kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja oge ọ gara hụ Onyeisiala Muhammdu Buhari gbasara ọnọdụ enweghị nchekwa dị n'Anambra steeti. Obiano kwuru sị: ""Onweghị pati ọzọ dị n'Anambra, naanị APGA. Onweghị APC ọbụla dị n'Anambra."" ""Ndị ahụ ụnụ hụrụ banyere APC bụ ego ka ha gara ịnara. A kwụrụ ha otu narị nde naịra (N100 million) n'otu n'otu."" ""Ha ncha ka bụcha ndị APGA. Ha na-agbara anyị ama ihe na-eme n'ime APC."" Akụkọ ka na-abịa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58888406 +religion 2019 Prophecies: Amụma e buru na 2019, ndị mezuru na ndị gbara ụka "Dịka afọ 2019 na-abịa na njedebe, BBC Igbo lebara anya n'ụfọdụ amụma ndị ụkọchukwu mara banyere ihe ndị ga-emenụ. Nnyocha anyị gosiri na ụfọdụ mere , ebe ụfọdụ ghọrọ ka nri gbara ụka n'ihi na ha emezughị. 1. Buhari ga-emeri na ntuliaka 2019- Mbaka, Omale Onye Amuma Emmanuel Omale nke Divine Hand of God Prophetic Ministry dị na Abuja buru amụma na Onyeisiala Muhammadụu Buhari ga-emeri ntuliaka 2019. Fada Ejike Mbaka bụ onye ndu isi otu Adoration Ministry, Enugwu, kwuru na ya amaghị onye ga-emeri na ntuliaka 2019 mana na Atiku abughị ya bụ ""onye nzọpụta Naijiria."" Amụma ahụ mezuru dịka Buhari meriri Atiku na ntuliaka nke e mere n'ọnwa Febuwari afọ afọ 2019. 2. Atiku tinye uchu n'Ugwu Naijiria- Suleiman Johnson Suleiman nke ụlọụka 'Omega Fire Ministries International' nọrọ n'amụma nke ya dọọ Abubakar Atiku nke PDP, onye ya na Buhari zọkọrọ ọkwa na ntuliaka ahụ, aka na ntị ka o tinye uchu karịa na inweta nkwado ndị ugwu na ntuliaka 2019. Nke a mezuru n'ihi na Atiku nwetara ezigbo nkwado na Ndịda Anyanwu Naijiria ma gbaa ọnyụpa n'Ugwu Naijiria. 3. A ga-anwụchi onye zọrọ ọkwa onyeisiala Suleiman makwara amụma na a ga-anwụchi otu onye zọrọla ọkwa onyeisiala. Nke a mezuru n'ihi na ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ DSS nwuchiri Omoyele Sowore nke zọrọ ọkwa onyeisiala na Ntuliaka 2019 n'aha AAC maka ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmenti tụnye ya na nga ọnwa anọ. 4. Otu onye chịbụrụ gọvanọ ga aga nga- Omale Omale bukwara amụma na otu aka chiburu otu steeti ga-aga mkpọrọ. Nke mezuru dịka Orji Uzor Kalu chiburu Abia steeti nọ n'ụlọ mkpọrọ ugbua dịka a mara ya ikpe imefu ego ndị Abia. Amụma ndị emezughị; 5.Ntọ nnukwu ọgaranya si Ọwụwa Anyanwụ na-azụ ahịa mmanu Omale kwuru na a ga-akpa nkata igbu maọbụ ịtọrọ otu onye nnukwu mmadụ si Ọwụwa Anyanwụ nọ n'ahịa mmanu nke ga-ebute ọgbaghara a ga-eji gbaa ahịa a ma ama ọkụ. Ahịa Onicha na Balogun dị na Legọs gbara ọkụ mana o nweghị ka o siri metụta ọgaranya Igbo ọbụla. 6. Ndịagha ga-enupu isi- Ayodele Primate Elijah Ayodele nke INRI Evangelical Church mara amụma na ndị agha Naijiria ga-enupu isi nye ndị isi ha. Nke a emezughị, mana ihe o kwuru na ihe ga-esiwanye ike mezuru dịka ihe ịda oke ọnụahịa na-aga n'ihu. 7. Atiku ga-eweghara ọchịchị n'aka Buhari- Olagunju Wale Olagunju, nke ụlọụka 'Divine Seed of God Chapel Ministries', Sasa,Ibadan mmara amụma na Chineke ga-anara Buhari ọchịchị nyefe Atiku n'aka n'afọ 2019. Nke a emezughị. Buhari ka nọ n'oche ya. Naịjiria bụ ala ọtụtụ ndị nọ na ya ejighị okpukperechi na okwu sị n'ọnụ ndị ndu ha egwu egwu, n'agbagheghị mpụtara okwu ndị ahụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50919804 +politics Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Ewepụla ọnụ na-ekwuchitere ụlọomeiwu na Platu steeti na onye ndu ndị ụlọomeiwu Akụkọ ndị dị mkpa Okwu na-ewu n'elu soshal midia ọkachasị Twita bụ ihe gbasara ikikere nwaanyị ịzụta maọbụ rite ala n'aka nna ya n'ala Igbo. Ụfọdụ na-ekwu na ha kwenyere n'omenala a ebe ndị ọzọ na-ekwu n'oge eruola iji gbanwe ya bụ omenala. Ndị ụlọomeiwu Imo steeti nwere nzuko n'isi osote gọvanọ ha bụ Eze Madumere ekpebiela na ọ bụ ọkaikpe nke steeti ahụ ga-ekwu ma aga-achupụ ya n'oche ọchịchị n'ime ọnwa atọ maọbụghị. Cheta na ndị ụlọomeiwu nke Imo steeti kwuru na ha ga-achutu Madumere maka ebubo nrụrụaka ha boro ya. N'okwu yiri ibe ya Achụturu Peter Azi bụbu ọnụ na-ekwuchitere ụlọomeiwu nke Platu steeti n'ọkwa ya n'ehihie taa. Onye ọọ ewepụrụ bụ inyeisi ndị kachasị n'ọnụọgụgụ bụ Henry Yunkwap. N'akụkọ ofesi Praim minista mba Jamini na Onyeisiala mba Amerịka amaala aka dịka ha na-akwado ịga nzụkọ otu NATO na Brussels. Donald Trump na-ebo ụfọdụ mba n'ime ọgbakọ ahụ ebubo ịkpachi ego ha. N'Egwuregwu, Ebe niile tọgbọ chakoo ugbua na mba Briten ebe otu egwurewgwu ha na-akwado ị zute Kroeshia na asọmpị ga-egosi onye ga-abịa nso ị bu ikombaụwa. Anyị ga-ama onye ga-emerị ma ọ kụọ elekere asaa nke mgbede a. Gee nkeji nke mgbede a: https://www.bbc.com/igbo/afirika-44798289 +sports Abaribe kwuru na 'Buhari adịghị ike ọrụ' Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Ndị Ụlọomeiwu ukwu nwere ọgbaghara n'etiti ha taa mgbe Sịnetọ Enyinnaya Abaribe nke Abia Steeti kwuru na onyeisiala Mohammadu Buhari adịghị ike ọrụ. Abaribe rụtụrụ aka n'okwu onyeisiala kwuru na Lọndọn na ọ bụ ndị si mba Libịa butere ogbugbu dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụugbo. Onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Mahmood Yakubu ekwuola na ụlọọrụ ahụ agaghị eji ngwa electronic eme ntuliaka afọ 2019, kama ha ga-eji technụzụ maka ịgụkọ na ngọsịpụta ntuliaka ahụ. Yakubu kwuru nke a na mmechi ọgbakọ emere maka iji technụzụ eme ntuliaka na Mba Afrịka niile. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron ekwuola na onwere ihe ngosi na gọọmenti mba Sirịa jiri ngwagha kemịkal wakpoo obodo Douma. Macron kwuru na ọ ga-ekpebi mgbe ọ ga-eji ngwaagha ụgbọelu wakpọ Sirịa na nzaghachị. N'egwuregwu CSKA Moscow ga-ele Arsenal ọbịa n'ukwu abụọ nke asọmpi Uefa Europa n'abalịa. Cheta n'ụkwụ nke mbụ, Arsenal jiri ọkpụ anọ asatara otu merie ndị CSKA Moscow n'asọmpi ahụ. Nkeji nke mgbede a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Kelechi Amadi-Obi bụ onye ose foto ama ama gwara anyị n'ime onyonyo a, ihe ị kwesiri ị ma, ma mee maọbụrụ na ị chọrọ ka ị dịka ya dika onye osefoto. https://www.bbc.com/igbo/afirika-43746605 +entertainment Imo Awka Festival: Etu ụmụntakịrị n'Awka si esonye n'emume iti mmọnwụ Ọ bụ eziokwu na iti mmọnwụ bụ ihe ndị okeye n'omenala Igbo. Mana ọtụtụ nne na nna na-amalite n'oge kuziwere ụmụ ha ihe gbasara ya bụ omenala. N'emume Imo Awka nke afọ 2021, ụmụnne abụọ bụ Ifechukwu na Nzube Chukwu Obi kọọrọ anyị ihe mere nne na nna ha ji kwadoo ha isi na nwata tiwe mmọnwụ. Gere akụkọ ha kọọrọ anyị. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Mgbeahuru na Chukwunaeme Obiejesi. https://www.bbc.com/igbo/57541844 +politics Yemi Osinbajo: Etu ndị Anambra siri nabata ya n'Eke Awka taa "Osote onyeisiala bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo wụchiri n'ahịa Eke Awka nakwa Ọchanja ndị dị n'Anambra steeti iji maata etu usoro 'Tradermoni' si emetụta ndụ ndị na-azụ ahịa. Na njem ahụ ọ gara, ọ gara leta Obi na-achị Ọnịcha bụ Igwe Alfre Achebe ịkwanyere ya ugwu. Ọ malitere njem ya n'Enugwu steeti ebe aka na-achị steeti ahụ bụ Ifeanyi Ugwuanyi nabatara ya n'ọdọugboelu Akanu Ibiam. ""Anyị agaghị agbachi nkịtị"" bụ ihe na-afịọ n'obodo Algeria dịka igwe mmadụ pụtara ịme ngagharịiwe maka ọchịchị nchịgbu n'ala ahụ. Ha kwukwara na ha chọrọ ntuliaka ziri ezi nke ala ha tinyere n'ụbọchị 4 nke ọnwa Jụlai. Otu Ipob akpọkuola ndị otu ha nakwa ndị niile mkpamkpa ndị Boko Haram na ndị ọchịehi metụtara ka ha nọrọ n'ụlọ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee. Ha kwuru na ọ bụ jị ruo ụjụ maka ndị ọchị echi kwafuru ọ bara ha nakwa ndị niile e gburu na mbọ nweronwe Biafra. Odeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Emma Powerful sị na ụbọchị ahụ ka ha ga-eru uju maka ndị nwụrụ n'aka ndị Boko Haram nakwa ndị na-achị ehi. Powerful sị na ""a ga-amụ anya mbọmchi n'abalị bọtara ụbọchị ahụ n'ụka, mọsk nakwa sinagọgụ bụ ebe a ga-ekpe ekpere maka mkpụrụ obi ndị nwụru n'aka nwakpo ndị Boko Haram nakwa ndị gọọmenti"". Enyi Jacinda Arden, Praim Mịnịsta mba New Zealand bụ Clarke Gayford agbanyela ọdịyanobi ọlaaka nkwa alụmdi. Akụkọ na mmadụ abụọ mere nke a pụtara ka otu onye ntaakụkọ anya ya dị nkọ hụrụ ka ọla mgbuke na mkpịsịaka nke etiti Arden were jụọ ụlọọrụ ya maka ya. Gayford na Arden zutere onwe ha mbụ n'afọ 2012 na mmemme inye nturuugo. Ọnụ na-ekwuru ya were kwuo na ha mere emume ikwerịtara onwe ha nkwa n'oge mmemme 'Easter.' Cheta na n'afọ gara aga, Arden mụrụ nwa mbụ ha. Arden bụ nwaanyị na-achị mba abụọ na-amụ nwa ka ọ nọ n'ọkwa ọchịchị. Onye mbụ mere nke a bụ Primae Mịnịsta chịị Pakistan Ugboro abụọ bụ Benazir Bhutto nwụrụ anwụ. Rochas Okorocha: Anyị ga-agbaso mkpebi ụlọikpe- Inec Inec ekwuola na ha ga-enwe ọgbakọ iji lebanye anya na mkpesa ọhụrụ nke Rochas Okorocha detara ha maka njichi ha jichiri asambodo mmeri ya. Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha kwusiri ike na akwụkwọ o degaara onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu na nso nso a sị na Inec enweghị ike ịnapụ ya mmeri o meriri na ntuliaka e mere n'ọnwa Maachi ma kpọọ oku ka ha nye ya asambodo ahụ. Na nzaghachi, ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye kwuru na ndị isi ụlọọrụ ha ga-atụnye ọnụ n'okwu ahụ n'ọgbakọ ha ga-enwe n'izu ọzọ. ""Onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu bụ onye Okorocha degara akwụkwọ anọghị n'ụlọ. Ọ gara alabekee. Ọ lọta, anyi ga-enwe nzụkọ banyere mkpesa ahụ Rochas wetara."" Mgbe BBC jụrụ ya na nzụkọ ahụ apụtara na a ga-ewepụta okwu ahụ n'ụlọikpe ebe ọ nọ ugbua, Okoye kwuru sị: "" A ga ahapụ okwu ụlọikpe ka ọ gaa ka o siri kwesị."" Ọ bụrụ na ụlọikpe si ka anyị nye ya akwụkwọ anyị enye ya. ""Ụlọikpe sị anyị enyela ya anyị agaghị enye ya."" ""Ọ bụ mkpebi ụlọikpe ka anyị ga -agbaso."" EFCC anwuchiela mmadụ iri atọ na asaa bụ ndị ha sị bụ ndị Yahoo Yahoo na Owerri. Nke a mere ka a gbachara ha ama maka ụdị okoko ndụ ndị ahụ na-ebi n'Okwu Urata, Aladinma nakwa Egbu nke dị n'Owerri, Imo steeti. Nwanna a, ị ma na Facebook nwere ike ịmachị gị ma ị zipu ozi nwere ike ịbute ọgbaaghara? Facebook machiri Milo Yiannopoulous, Alex Jones na Louis Farakhan bụ ndị ha sị na ha na-ezipu ajọọ ozi nwere ike ibute ọgbaaghara n'ụwa. Arsenal meriri Valencia 3- 1 Arsenal azaala odogwu n'asọmpị ha na ndị Valencia ụnyahụ bụ ebe ha ji ọkpụ atọ asatara otu nyụọ ha anya. Mmeri a mere ka Arsenal manye otu ụkwụ na agba nke ikpeazụ na egwuruegwu Europa League." https://www.bbc.com/igbo/afirika-48144879 +entertainment Ikenokwalu Godson: Ihe mere m ji eji ọnụ, ụkwụ, ntị n'akụkụ ahụ m ndị ọzọ ese ihe Mmadụ iji aka ese ihe abụghị nnukwu ihe akụkọ, mana Ikenokwalu Godson ji akụkụ ahụ ya ọbụla ese ihe. Ma aka, ụkwụ, isi, ọnụ, ntị, ọkụ maọbụ ihe ọ bụla, Godson jicha ha ese ihe. Ọ kọọrọ BBC Igbo etu o si malite nakwa ihe na-akpalite mmụọ ya. Gere ye n'uju n'onyonyo dị n'elu. Onye mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-55185280 +business Ọgba Mbọ: Lee Joy Nwokeocha, nwaanyị ji ụdara nwannu emepụta 'juice' na 'jam' "Joy Nwokeocha bụ ọkachamara n'iji nri eme ka ahụịke mmadụ kawanye mma; bekee na-akpọ ya ""Clinical nutritionist"". Ọrụ ya bụ ịchọpụta ihe ndoziahụ dị icheiche jupụtara na nri mmadụ na-eri nakwa etu ị ga-esi rie ya ka ahụ gị nabata ya. Oriaku Joy Nwokeocha kọọrọ BBC Igbo etu o si malite iji ụdara emepụta mmanya ụtọ Bekee kpọrọ Juice, nakwa ihe ụtọ e ji ata achịcha, a na-akpọ 'jam' na bekee. O kwuru na ụdara nwere ọtụtụ akụrụngwa na-edozi ahụ, ọ kachasị 'viscus fibre' nke na-enye aka ewepụta oke abụba dị mmadụ n'ahụ. N'ihi nke a, oge ụmụ ya jụrụ na ha agaghị aracha ụdara, Joy Nwokeocha malitere iche ụzọ ọzọ ọ ga-esi mee ka ụmụ ya nwee mmasị ịracha ụdara. Nke a mere o ji chepụta iji ụdara eme mmanya ụtọ nakwa 'jam' e ji ata bureedi. ""Ndị niile ṅụrụla mmanya a m ji ụdara mee na-ekwu na ọ na-atọba ha n'ụbụrụ,"" oriaku Nwokeocha kwuru. ""Ugbua, naanị ezinụlọ m, ndị enyi m, na ndị enyi di m ka m na-emere ya, mana enwere m olileanya, otu ụbọchị, imepụta ya ebe o buru ibu na-ere ya n'ahịa."" Joy Nwokeocha kọkwara ihe ndị na-echere ya aka mgba imepụta ""ụdara juice"" n'ebe o buru ibu. ""Nke mbụ bụ ọkụ latrik. N'ihi na anaghị m etinye akụrụngwa 'preservatives' ọbụla iji mee ka mmanya a nọtee aka, ọ dị mkpa ka ọ na-adị n'ime igwe njụoyi oge niile."" ""Ọzọkwa bụ etu m ga-esi na-enweta ụdara nwannu kwa afọ, maka na ụdara nwere oge o ji apụta nakwa oge o ji akọ."" ""Mana enwere m olileanya na aga m emeri ihe ndị a niile na-echere m aka mgba n'oge adịghị anya."" Dịka onye ọkachamara n'iji nri ewulite ahụike, Joy Nwokeocha kwuru na ọ dị mkpa ị na-eri nri dị kc chi si kee ya, na-abụghị nri ndị a rụpụtara arụpụta. ""Ọtụtụ akwụkwọ nri na mkpụrụosisi anyị na-eri nwere ọtụtụ ihe ọma jupụtara n'ime ha na-edozi ahụ, ọ bụrụ na mmadụ na-eri nri ndị a, ọrịa ga-anọte aka n'ebe onye ahụ nọ,"" ka o kwuru." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61139279 +entertainment Jeff Zucker bụ onyeisi ụlọọrụ CNN agbala arụkwaghị m maka ije nwaanyị "Jeff Zucker bụ onyeisi ụlọọrụ CNN nke bụ ụlọọrụ mgbasaozi a ma ama agbaala arụkwaghi n'ọrụ n'ihi na o kwupụtaghị ime enyị ya na otu onyeisi ọrụ ya mere n'oge gara aga dịka iwu ụlọọrụ ha si dị. Maazị Zucker dị afọ 56 kwuru n'akwụkwọ ozi o zigara ndị ụlọọrụ ahụ na o mehiere maka na o kwupụtaghi ime enyi ahụ. E mere nchọpụta ime enyi a mgbe ndị otu nnyocha nọ n'isi okwu Chris Cuomo bụbu onye ụlọọrụ ahụ achụrụ n'ọrụ maka ikpuchi mmehe nwanne ya nwoke mere n'oge gara aga nke gụnyere ebubo mwakpoo otu nwaanyị. Ihe a bụ ihe ịtụ n'anya dịka Maazị Zucker bụ onye ogogo ya riri elu n'ọrụ mgbasaozi na mba Amerịka. N'ozi e zigara ndị ụlọọrụ ahụ nke otu onye n'ime ha zipụtara n'ịntanetị, Maazị Zucker kwuru na a jụpụtara ya maka ime enyi a mgbe a na-eme nnyocha n'isi otu ogbo ya bụ Chris Cuomo. Cheta na okwu Cuomo dapụtara mgbe e kwuru na ọ gbara mbọ ikpuchi mmehee nwanne ya Andrew Cuomo onye bụbu Gọvanọ New York nke mba Amerịka nke ebubo e boro ya gụnyere mwakpoo nwaanyị. Maazị Zucker kwuru n'ozi ya na ya na ogbo ya mere eyi arụọla ruo ihe ruru afọ iri abụọ nke mere na ime enyi ha jiri gbanwee banyezie na nke ime mmekọ na nso nso a. O kwuru ""E kwesịrị m ekwupụta ime enyi a mana m ekwughi ya, a ma m na m mehiere, nke a mere m ji agba arụkwaghị m n'ọrụ m"" Akwụkwọ ozi ya ekwupụtaghi onye ọrụ ya bụ ihe ya na ya mere enyi a mana ụlọọrụ CNN kpọpụtara aha as Allison Gollust n'okwu a. Allison Gollust bụ otu onye nwere agba n'ọrụ ahụ dịka ọ bụ osote onyeisi nakwa onyeisi anchụmnta ahịa n'ụlọọrụ ahụ. Nwaada Gollust kwuru n'ihe onyonyo ya na ogbo ya bụ Maazị Stelter mere n'ụbọchị Wenezde sị ""Mụ na Jeff bu ezigbo enyi n'oge gara aga ma rụkọọ ọnụ ruo afọ iri abụọ mana na nso nso a oge ọrịa Covid-19 malitere mụbanwanyewe, ime enyi anyị bịara gbanwee"" Ọ gara n'ihu kwuo ""A nam ata onwe m ụta na anyị ekwupụtaghi ime enyi anyị mgbe anyị kwesiri"" Nwaada Gollust kwuru na ọ ga aga n'ihu na-arụ na ya bụ ụlọọrụ. Ka ụlọọrụ mgbasaozi New York Times si kwuo, nwaada Allison Gollust nakwa Maazị Jeff Zucker bụ ndị gbarala alụkwaghị n'oge gara aga. Maazị Zucker eserela aka ya n'ịbụ onyeisi ngalaba mgbasaozi nke WarnerMedia nakwa nke ozi egwuregwu ha. Ọ malitere ịrụ ọrụ na CNN na afọ 2013. Ihe bụ mgbe ụlọọrụ NBC nyere aka chịbụrụ mba Amerịka bụ Donald Trump ikekere ime ihe onyonyo e ji mara ya bụ ""The Apprentice"". Ọtụtụ ndị tụrụ Maazị Zucker aka n'oge gara n'ihe etu a si na o si mee ka ya bụ ụlọọrụ buru okwu Donald Trump n'isi ọkachasi mgbe emere ntuliaka ime ụlọ nke otu pati Republican. Trump gbara ama etu CNN si buru okwu ya n'isi mgbe ahụ ezighi ezi ma ncha. Ọkaikpe nọ n'isi okwu Nnamdi Kanu na gọọmentị etiti bụ Binta Nyako adaala ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami nha ọnụ ego puku nari narịa abụọ (N200,000.00). Nyako mere nke a n'ụbọchị Wenezde n'ihi na Malami na ọgbọ ya apụtaghị ụlọikpe maka ikpe mmadụ anọ ndị ọzọ e ji eji kamgbe afọ 2017 n'ihi ebubo na ha so Nnamdi Kanu kpaa nkata ikposa ịdịnotu Naịjirịa. Ọkaikpe Nyako kwuru na Malami ga-akwụ mmadụ anọ a bụ Bright Chimezie, Chidiebere Onwudike, Benjamin Maduagwu, na David Nwaurusi puku iri ise n'otu n'otu maka ịta ha ahụhụ ịpụta ụlọikpe ebe ya na ogbo ya bụ Shuaib Magaji Labaran apụtaghị. O kwukwara na a ga-akwụrịrị ego ịda nha a tupu ụbọchị 17 nke ọnwa maachị nke bụ ụbọchị eyighariri ikpe Nnamdi Kanu. Ikpe a ruru ọkaikpe Nyako ntị site n'aka ọkaiwe Nnamdi Kanu ebe ha mere mkpesa kwuo na ha tara oke ahụhụ ma chọọ ego pụta ụlọikpe n'ụbọchị ahụ mana ọkaiwe gọọmentị etiti na ogbo ya apụtaghị. Otu nwaanyị si n'ụlọọrụ na-ahụ maka ikpe bụ Adewumi Aluko gwara ọkaikpe Nyako na Shuaib Labaran mere njem pụọ ala Naịjirịa ugbua ya mere na ọ pụtaghị ya bụ ikpe. Ọkaikpe Nyako anabataghi mkpesa ahụ ma ncha n'ihi na o kwuru na ndị ọkaiwu gọọmentị na-akpụ ụkwụ n'ala kamgbe afọ 2015 mgbe okwu a dapụtara. Cheta na Nnamdi Kanu bụ onyendu otu ""Indigenous People of Biafra"" (Ipob) nke gọọmentị Naịjirịa nwụchịrị n'afọ 2021 maka ebubo ikpa nkata ikposa ịdịnaotu Naịjirịa. Ndịagha Naịjirịa wakporo ụlọ nna ya n'Afaraukwu nke Umuahia, Abia steeti n'afọ 2017 nke mere o ji gbaa ọsọ gbaga mba ọzọ. Otu Ipob bụ otu kwuru na ha na-achọ nwereonwe ndị Igbo mana ugbua gọọmentị Naịjịrịa amachịela otu a maka ọtụtụ ebubo nọ n'isi ha. Mason Greenwood na-agbara Manchester United bọọlụ apụtala n'aka ndị uweojii site na nwuchi a nwuchiri ya maka ebubo ịwakpo nwaanyị. A nwuchiri nwamadị a dị afọ iri abụọ na Sọnde n'ebubo na ọ chọrọ idina nwaanyị n'ike nakwa iyi egwu igbu mmadụ na soshal midia. Otu ya bụ Man United sị na ọ gaghị agbara ha bọọlụ ọzọ ruo oge a na-amabeghi. Ndị uweojii sị na a nwuchiri ya mgbe ha hụrụ ihe foto na soshal midia nke otu nwaanyị tinyere na-ebo ya ebubo ịwakpo ya. Site na nwuchi nwamadị a, ọtụtụ ndị ọgba bọọlụ ibe ya nakwa ụlọọrụ dị iche iche agbahapụla ya. Ụlọọrụ FIFA ewepụla aha Greenwood n'aha ndị ọgba bọọlụ nke a kpọrọ FIFA 22. Greenwood malitere ịgbara United bọọlụ n'uju n'ọnwa Maachị afọ 2019 na nkwerịkọta ịgbara ha bọọlụ ruo afọ anọ. Vladmir Putin asaala ebubo na mba ya chọrọ iwakpo Ukraine N'ofesi, onyeisiala mba Russia bụ Vladmir Putin ebola mba Amerịka ebubo ibute agha n'etiti mba ya na Ukraine. N'okwu mbụ ya pụrụiche gbasara ebubo na mba ya chọrọ iwakpo mba Ukraine, Putin kwuru na ebumuche mba US bụ ikpalite okwu ga-eme ka ha nyekwuo mba Russia ntaramahụhụ. Putin kwuru na mba US na-eleghara nchekasị Russia nwere gbasara ndị agha Nato nọ n'Europe. Mba US na ndị otu na Nato na-ebo mba Russia na ha na-akwado iwakpo Ukraine, ihe Russia na-agọsi ike na ọbụghị eziokwu. N'ime izu ụka gara aga, Russia zipuru ndị agha ruru otu narị ha bunyere ọtụtụ ngwa agha ka ha ga-akwụrụ n'oke ala ha na mba Ukraine. Nke a na-abia dịka mba Russia weghara mpaghara Ukraine akpọrọ southern Crimea peninsula site n'ọgụ akwafuru oke ọbara n'ogbe Donbas. Moscow na-ebo gọọmenti Ukraine ebubo na ha emezughị nkwekọrịta ha nwere iweghachi udo na mpaghara ọwụwa anyanwụ ebe egbugoro mmadụ ruru puku iri na anọ nakwa ndị nnupuisi Russia kwadoro na-eweghara ogbe ahụ n'ike n'ike. Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky adọọla aka na ntị na mwakpo Russia agaghị abụ agha n'etiti Ukrine na Russia kama ọ ga-abụ agha ga-eme na Europe. Onyeisiala Putin kwuru na ọ na-eche ""na mba Amerịka ebughị nchekwa Ukraine n'obi kama ha chọrọ ibelata ntolite mba Russia."" Esemokwu dị n'etiti Russia na US malitere n'oge akpọrọ Cold War (1947-1989), Mgbe ahụ Ukraine ka sonyere na communist Soviet Union. Putin kwuru ""na ekwe ka Ukraine sonye otu Nato , ọ nwerike iweta agha n'etiti ndị niile nọ n'otu Nato na Russia."" Mana mba US ekwuola na ihe ha chọrọ bụ iji mkparịtaụka mee ihe ọbụla gbasara nchekasị nchekwa ọbụla. N'aka ọzọ, mba US kwuru na mbido izu ụka a na ha natara akwụkwọ ozi si mba Russia bia gbasara ibelata okwu na-achọ ise n'etiti mba ahụ na Ukraine, mana minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi na Russia kwuru na nke a abụghị eziokwu. Ụlọọrụ NCDCenyela ndị ""unknown gunmen"" ọsọ n'Ebonyi Ndị ọrụ Nigeria Civil Defence Corp chụsasiri ndị oji egbe egbu biara iwakpo obodo Ndufu-Achara dị n'okpuruọchịchị Ikwo n'Ebonyi steeti n'ụbọchị Tuesde. Onyeisi Ncdc n'Ebonyi steeti bụ Terrumun Gbue kwuru na onweghị onye nwụrụnụ na mwakpo ahụ. Akụkọ kwuru na ndị omekome ahụ bucha egbe A-K47 , yiri nani ọbante mgbe ha na-aga iwakpo obodo ahụ. Gbue kwuru na ndị omekome ahụ gbukwara ndị otu Ebubeagu ruru atọ n'oge gara aga nke mere ka ọtụtụ mmadụ kwuo na ha achọghịzi Ebubeagu n'obodo kamgbe afọ gara aga. O kwuru na ndị uweojii nakwa ndị ọrụ Nigeria Civil Defence Corp jịkọrọ aka chụmie ndị oji egbe egbu ahụ. Gbue kwuru, "" ọ bụghị mgbe mbụ ndị omekome na-agbapu egbe maka igosi na ha achọghị Ebubeagu."" Kedụ ndị bụ Ebube Agu? Ebube Agu bụ otu nchekwa ndị gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ hibere iji buso nsogbu nchekwa dakwasịrị mpaghara ahụ agha. E hibere ha n'ọnwa Epreelụ, afọ 2021, ka ndị gọvanọ Ọwụwa anyanwụ ndị na ndị isi ọrụ nchekwa mechara nzukọ n'Owere, Imo steeti. Isi ụlọọrụ ha dị n'Enugwu steeti, ebe ha si achịkọta ndị otu ha ndị nọ na steeti ndị ọzọ. Mgbe Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti na-ehibe otu Ebube Agu nke steeti ya, o kwuru sị ""Ọ bụ Ebubeagụ ga-enyere onyeisiala Muhammadu Buahri aka maka ọrụ ya na nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60187422 +sports Carlo Ancelotti abụrụla onye nchịkọta nke ise a ga-achụ n'ime otu ọnwa "Ajụjụ dị ọtụtụ ndị n'ọnụ ugbua bụ 'kedụ onye nchịkọta ọzọ oge ya ruru ịkwara pụọ?' Nke a bụ maka etu Carlo Ancelotti si sonye na ndị a chụrụ achụ dịka Napoli nyere ya ọsọ n'abalị iri nke Disemba 2019, n'agbanyeghi na o meriri n'asọmpi Champions League. Ọchụchụ Ancelotti chịkwaburu Chelsea bịara n'ihi na o nwetaghị mmeri n'ime egwuregwu itoolu ikpeazụ Napoli gbarala na Serie A. N'otu aka ahụ, ndị mmadụ na-ajụkwa ma Premier League ejizi ụtalị mmụọ apịapụ ndị nchịkọta ha? Gịnị mere ha ji ajụ ajụjụ a? Ọ bụ naanị onye uche ya na-adịghị n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ bụ onye amaghị na a chụọla ndị nchịkọta anọ n'ime otu ọnwa. Tottenham Tottenham malitere egwu oke a mgbe ha sepụrụ Mauricio Pochettinho oche n'otele. Na-erughidị awa 24 e ji chụọ ya, a kpọta 'ọgba afa' nke egwuregwu bụ Jose Mourinho, ka ọ bịa gosipụta ike ya. Arsenal Na-erughi otu izu, a dọrọ Unai Emery dọpụ n'ezi, sị ya kwara ngwongwo ya lawa. Ha họpụtara Fredrik Ljunberg bụ onye gbabuuru Arsenal bọọlụ n'oge gara aga, ka ọ bụrụ onye nkuzi nchere oge. Mana agbanyeghị nke a, Arsenal ka na-agbakwa ọnyụpa. Watford N'ime otu izu ahụ onye nke Watford bụ Quique Sanchez Flores esorokwa ha n'azụ. Nke Flores bụ na ekweghidị ya tụọ ute rahụ ụra tupu a wụọ ya mmiri oyi a iji kpọte ya n'ụra. Florez nọrọ naanị ọnwa atọ n'ọkwa tupu a gbaara ya ụgbọ nwa mkpi. Everton Ugbua Marco Silva esonyekwala na ndị anamachọọrụ. Oteela atụwara anya na ndị Everton ga-enye Silva ọsọ. Mana ọ bụ mmeri Liverpool meriri ha ụbọchị ụka gara aga ka Ọchụchụ eleghi anya n'azụ a emeela ka ndị mmadụ na-ajụzị sị ""Kedụ onye ụtalị mmụọ ga-ada n'azụ ọzọ?"" Onye ọzọ ọkụ nọ n'ike ugbua bụ Manuel Pellegrini, onye nkuzi ndị Westham. Pellegrini meriri naanị otu n'ime asọmpi asaa ha gbara n'ọdị nso a. Mmeri ha nwetara bụ n'aka ndị Chelsea n'abalị ikpeazụ nke ọnwa Nọvemba. Ọzọkwa bụ onye nkuzi ndị Norwich bụ Daniel Farke. Naani otu mmeri ka o nweterela n'ime asọmpi asatọ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50683675 +entertainment Eid-el-Kabir: Ihe ndị ị ga-ejinwu ụbọchị ezumiike abụọ a mee "Gọọmentị Naịjiria ekwuola ka ndị mmadụ were ụbọchị abụọ zuru ike maka emume Eid-el-Kabir, mana gịnị ka ị ga-ejinwu ha mee? Nye ụfọdụ ndị, ụbọchị abụọ ahụ dịkwa ka ụbọchị ọbụla ha na-agaghị ọrụ, mana nye ụfọdụ ndị ọzọ, ọ bụ mgbe ha ga-emeju ihe Bekee kpọrọ Activity afọ. Mana ị ma na ị ga-emenwu ka ụbọchị abụọ ahụ baara gị uru site n'ime ihe ndị a anyị ga-atụlitere gị elu ugbua: 1) Rahụ ụra N'ezie i nwereike ịjụ ma ""isi ọ dịkwa onye dere akụkọ a mma"", mana eziokwu bụkwanụ na ezigbo ụra bụ ndụ. Ọtụtụ ndị anaghị enwetekarị ohere ịrahụ ezigbo ụra n'ihi ihe gụnyere: Mana ihe ọma ị nwereike imere onwe gị n'ime ụbọchị abụọ a gọọmentị ji menyere gị, bụ ịhụ na gị na ụra bụ nwanne mgbe ọbụla ọ tụwara gị, n'ihi na ọ ga-eso n'ihe ndị ị ga-achọ achọ ma sị ""a matara m mee"" mgbe ị ga-alaghachịkwa ọrụ. Ọ ga-edozikwanụ gị ahụ ọfụma. 2) Gụọ akwụkwọ Onye na-agụ akwụkwọ na-emepe ụbụrụ nakwa anya ya ma na-akụziri onwe ya ọtụtụ ihe dị iche iche ga-abara ya uru n'ụwa. Ịgụ akwụkwọ na-eme ka mgbakasị ahụ nke Bekee na-akpọ ""stress"" belata nke bụ na ị na-enyekwa onwe gị ezumike ruru gị mgbe ị na-agụ ya. Ọzọ bụ na onye na-agụ akwụkwọ na-atọ ya ụtọ maọbụ na-akụziri ya ihe anaghị ederu ya ala, nke a ga-enyere gị aka ịkpị ""data"" dị n'ekwentị gị ị gaara eji agazu ụwa dum na soshal midia. 3) Rie nri Nwanne nri dị ezigbo mkpa, mana dịka ọnọdụ dị ugbua, ọ dị mkpa iri naanị mgbe ọ gụrụ gị kama ị na-atagharị ọnụ chọm chọm chọm (ọkwa ị chịala ọchị ugbua makana e jidere m gị). Gbaa mbọ hụkwa na nri ị na-eri bụ nke na-edozi ahụ dịka akwụkwọ nri na mkpụrụosisi. Gọọmentị enyela gị ikike ịnọ n'ụlọ hapụ ịrụ ọrụ ụbọchị ahụ, ihe ọma ị ga-emere onwe gị bụ iri ihe ọbụla gụrụ gị, etu ọbụla o si gụọ gị. 4) Tụọ ute n'ala soshal midia/zụchaa ego gi Ekwenyere m na m sị gị gụọ akwụkwọ kama ịga soshal midia, mana ọ bụ naanị ụbọchị abụọ a ka i nwere ime ihe ọbụla gbasara gị tupu ọrụ ebidokwa n'ike ọzọ. Akụkọ asịrị ahụ na-efegharị ị kwere onwe gị nkwa na ị ga-ewetu obi mara ihe butere ya na ihe mechara mee, gaa chọta ya gụzuo ya. Ọrụ ahụ ị chọrọ itinye akwụkwọ maka ya, nwaanyị maọbụ nwoke ahụ ị chọrọ ịchụta, ugbua bụ ohere gị. Ego ahụ ị na-akpị kemgbe, were ya zụrụ uwe ọma, akpụkpọụkwụ, akpa, ihe ntecha, na ihe ndị ọzọ na-aba gị n'anya mgbe ị ji ọrụ n'aka. Ugbua, enweghizi onye ga-asị gị ""ngwa wetuo ekwentị gị, apịzịla ya ka ị ghara ịpịwa ya"" maọbụ ""ọkwa ị hapụla ọrụ ị na-arụ pịwa ekwentị"". 5)Gwuo egwuregwu Ọ bụ gị na ụmụaka bi n'ime ụlọ maọbụ n'agbataobi? I nwere ohere imenye ha obi aṅụrị. Bụrụ nne, nna, deede maọbụ daada nke a ga-eji ime obi aṅụrị mara site na iji egwuregwu debanye aha gị n'obi ụmụaka ndị a. Kuziere ha etu e si esi nri, eghe ihe n'ekwu ọkụ, etu e si ese ihe, etu e si agba egwu, kọọrọ ha akụkọ ifo, gụọrọ ha egwu ọnwa dgz. Ị nwekwara ike ịkpọkọta ha ọnụ gụọrọ ha akwụkwọ na-atụ ụtọ, na-agbanwe olu gị ka ị na-agụ ya. Ha agaghị echefu nke a echefu. 6) Lee ma ị ga-amụtanwu otu akaọrụ Nke a abụghị iwu o, mana ọ ga-abụ ihe dị mma nyere gị ma ọ bụrụ na ị ji ohere ndị ị nwere wee mụta otu ihe maọbụ abụọ ị na-amabughi eme mbụ. Nwanne m nwoke/nwaanyị, ọ bụrụ nri ka ị maghị esi, I nwaa ya ugboro abụọ atọ maọbụ anọ n'oge a I nwere ohere, I ga-amụta ya o bụrụgodi obere (nwanne agbakwala ụlọ ọkụ oo). Ọ bụrụ ịdụchi akwa dọkara adọka were nkịkara akwa mụwa ya ị ga-amụta ya. Ị maghị akpa isi mana e nwere ndị bu ntutu ebe ị nọ? Rịọ ha ka ị jiri ohere a mụta etu e si eme ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52270414 +business Ahụhụ ndị keke sị ha na-ata n'iji ịntanet akwụ ụtụisi keke n'Abia State Ndị na-akwọ ọgbatumtum keke n'Abia Steetị akọwala ihe ha na-ahụ n'iji ịntanetị akwụ ụtụisi keke dịka gọọmentị Abia si nye iwu. Ha kọwara na atụmatụ iji ịntanet akwụ ụtụisi keke dị mma mana ọghọm bụ na mgbe ụfọdụ aha gị agaghị apụta n'ịtanetị ma ị kwụchaa ụgwọ. Nke a na-eme ka ndị ọtawaike na-ahụ maka ịkwụ ụgwọ a ji anwụchi keke ha ma mee ka ha kwụọ puku narị atọ. Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ kọmishọna mgbasaozi nke Abia Steeti, o kwuru na ọ ga-azaghachị n'oge na-adịghị anya. Dịka akụkọ a na-apụta a ka na-ele anya ọsịsa n'aka gọọmentị Abia Steetị. Cheta na gọọmentị nyere ndị ọkwọ ọgbatumtum keke niile ụbọchị abụọ idebanye aha ha n'otu ga-ejikọta ha ọnụ ma ọ bụghị ya ntaram ahụhụ ga-adịrị onye ahụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-56016396 +health Ọkọ ngada: Gịnị na-ebute 'Ọkọ Junction'? "Ọtụtụ mmadụ na-akọ ọkọ na ngada mana ha amaghị ihe na-akpata ya. O nwere ọtụtụ aha e ji mara ọkọ a nke gụnyere 'ọkọ Junction', 'Ọkọ tee', ' ọkọ achọrọ m ịma', dgz. Ọrịa ọkọ ngada nke a na-akpọ Jock Itch n'okwu bekee bụ ọrịa ọkọ na-ebute ahụ mgbakasị. Ọkọ a nwereike ọ bịa mgbe ha chọrọ ime ihe dị mkpa maọbụ mgbe ha nọ n'etiti ndi mmadụ. Akụkọ a ga-gwa gị ihe na-akpata ọkọ ngada, mgbochi ya na ọgwụgwọ ya. BBC Igbo kpọtụrụ ọkammụta Uche Ojimma bụ ọkachamara maka ihe gbasara anụahụ mmadụ ma bụrụkwa onye isi Dermatologist Department nke University Of Nigeria Teaching Hospital. O tinyere ọnụ n'okwu a ma kụwa akụoyibo nsugbe gbasara ya bụ ọrịa ngada. Gịnị bụ ọrịa ọkọ ngada maọbụ Jock Itch? Dọkịnta Uche Ojimma kọwara na ọ bụ nje a na-akpọ dermatophytes na-ebute ya. Dermatophytes a sị n'ezinụlọ nje Bekee kpọrọ 'Fungus'. Ojimma kọwara na aha bekee ya bụ Jock Itch sitere ma bido dịka ndị na-eji ịnyịnya eme asọmpị a na-akpọ Jockeys na-ebute karị ya site n'ahụ ịnyịnya. Ya bụ ọkọ na-emekarị na ngada nwoke ma na-eme kwa ụfọdụ ụmunwaanyị. Ọ kọwara na ihe na-amasị nje Dermatophytes n'ahụ mmadụ bụ ceratin nke na-adị n'anụ ahụ, mbọ aka na ntụntụ isi. Ọ bụ ceratin a ka nje a na-eri. E nwere ọtụtụ ụzọ mmadụ si ebute ya bụ ọkọ ngada, kama otu ihe mmadụ kwesiri ịma bụ na ọdịda Afrịka ebe a na adịkarị ọkụ ma ikuku na-adị kwa mmiri mmiri nke a kpọrọ Humid na Bekee socha n'ihe na enyere aka ebute ọkọ ngada. Ọ bụ Dkt Ojimma kwuru nke a ma kọwa kwaa na ebe dị etu a na-eme ka ngada mmadụ nwee ọsụsụ ma di ọkụ. Ọ kọwara na ọ bụ ebe dị etu na-amasị nje Fungus nke na-ebute ọkọ ngada. Ọkọ ngada na-eme ka ahụ mmadụ na ekpecha ekpecha, ọ ga-akpọ nkụ ma na-acha kwa uhie uhie n'etiti ngada. Ojimma kwukwara na ọkọ a nwereike site na mbọ mmadụ ma fee na ebe ndị ọzo n'ahụ mmadụ. Ọ na-ebute oke ịkọ ọkọ na ngada, o nwereike site na ngada gafee n'ike mmadụ. 1) Ụgbọrọ ole ka ị na-eyi obante gị tupu ị saa ya? E nwere ndị na-asa obanta ha nanị mgbe o si were nsị. Dọkịnta Ojimma kwuru na ọ bụ nanị otu ugboro ka mmadụ kwesiri iyi obante ya Ọ kọwara na ọ dị mkpa mmadụ iyi obante nanị otu mgbe ma saa ya mmiri. Nke a agaghị enye nje dermatophytes ịmubanya n'ahụ mmadụ. 2) Lee kwa ma ọ bụ cotton ka eji mee obante gi Dtk Ojimma si "" Anytị na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha na-eyi uwe okpuru maọbụ boxer eji cotton mee"". O kwuru na nke a ka mma karịa mmadụ iyi 'Tight' nke na eme ka ọsụsụ na asụ mmadụ na ngada. Ojimma kwuru na obante eji cotton mee ka mma n'ihi na cotton ga amipụcha ọsụsụ ma nye kwa ohere ka ikuku na abata na ngada. 3) . . . Umunwaanyị kwanu? Dkt Ojimma kwuru sị ""Ọ dị mkpa ka ụmụnwaanyị na-eyi ịba nwere ohere ikuku sị apụ ma nke e ji cotton mee"". O kwukwara ka ụmunwaanyị na eyi obante ha nanị otu ugboro. Ojimma rụtụkwara aka na ọ dị mkpa ka ha na-asa ahụ ha oge niile. 4) Ozughị nanị n'ịsa obante gị Dkt Uche Ojimma kwuru sị "" Onye sachaa obante ya, ya were igwe iron dakpọọ ya"". Ọ kọwara na nke a ga-eme ka ọkụ si n'igwe Iron gbuo nje ọ bụla nwereike ị nọ n'ọbante. 5) ị na-eyi uwe ukwu maọbụ trauza mmadụ? Biko eyizila uwe ukwu mmadụ ọzọ maọbụ trauza ya. Ojimma kọwara na akpụkpa ahụ onye ahụ nwereike i site na trauza onye ahụ banye na nke onye ọzọ. Ọ kọwara na nke a bụ otu uzọ ọkọ ngada sị efesa. 6) ""Biko, nye m tọwel gị ka m were hichaa ahụ"" Biko sị mba! Dkt Ojimma kwuru na mmadụ iji akwa eji ehicha ahụ nke mmadụ ọzọ bụ etu ọzọ esi ebute ọrịa ọko ngada. O kwuru ka ọ bụrụ nanị otu onye ga-enwe akwa eji ehicha ahụ ma na sa kwa ya oge o kwesiri. 7) Ị dịna n'otu akwa Ụfọdụ mgbe, onye nwere ọrịa ọko ngada kọchaa ọko, akpụkpa anụ ahụ ya nke bekee kpọrọ ""scales"" nwereike dasa n'elu akwa. Mgbe onye ọzo dịnara na ya bu akwa, akpụkpa anụ ahu a banye ya na ngada, onye ahụ nwereike ibute ọrịa ọko ngada. 8) Aramara! Eeeeee! Dkt Ojimma kwuru sị ""Onye nwere ọkọ ngada nwereike ibunye onye ọzọ ya bụ ọrịa ma ha abụo nwee mmekọ. Ọkọ 'junction' na-ara ahụ ịgwọ. E nwereike iji ntule chọpụta ya kama ọ dị mkpa ka mmadụ gaa ụlo ọgwụ maka nyocha. Dkt Ojimma kwuru na ọgwụgwọ ọrịa ọkọ ngada na-esi ike ma na-akarị kwa otu ọnwa. E nwere ọtụtụ ọgwụ eji agwọ ya nke a na-akpo anti-fungal. E nwere nke a na aṅụ aṅụ ma nke a na-ete n'ahụ. Ndụmọdụ Dkt Ojimma gwara ndị mmadụ bu sị "" idị ọcha dị oke mkpa, biko yie ịba gị nanị otu mgbe"". Gbam!" https://www.bbc.com/igbo/53787536 +politics Imo state: Gọọmentị Ihedioha achọghị eziokwu, ihe ha chọrọ bụ imebo Okorocha Dịka ndị mmadụ na-ajụ nke bụ isiokwu n'etiti Rochas Okorocha na onye nọchịrị anya ya n'ọchịchị Imo steeti, BBC Igbo emeela njem nchọpụta. Jasper Ndubuaku, bụ onye ọtụtụ okwu na-erughari n'etiti ọrụ ya dịka onyeisi ngalaba na-achọta akụnaụba gọọmentị a na-eche na e zuru, gwara BBC Igbo etu okwu siri kwụrụ n'akụkụ ya. Steve Osuji bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nye Ihedioha n'ihe banyere mgbasa ozi, kwukwara etu o si metụta ha. Sam Onwuemodo bụ ọnụ na-ekwuru Sinetọ Okorocha zarakwara ọnụ ha. Ebe ndị nke Ihedioha na-ebo ebubo, ndị nke Okorocha na-agọ agọ, na-asị ha wete ihe mgbaama. Ihe nkiri a ga-akọwa ihe a niile site n'ọnụ ha. https://www.bbc.com/igbo/afirika-49511087 +health Coronavirus Outbreak: 'Etu m si chọpụta onye mbụ bu Covid19 na Naịjirịa' - Dr Allison Amarachukwu Karen Dọkịta Allison Amarachukwu Karen bụ onye chọpụtara nwoke mbụ si mba Ịtali bubata ọrịa coronavirus na Naịjirịa, kọwara etu o si chọpụta na ihe na-arịa nwoke ahụ bụ coronavirus. Ọ sị na site na ọzụzụ o nwere, mgbe nwoke ahụ gwara ya na oyi na-ama ya, isi ọwụwa, ike ọgwụgwụ na ọ matara na o nwereike ịbụ coronavirus. Na nke a mere o ji kpọtụrụ onyeisi ya kpọtụkwara ndị ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrị na Naịjirịa bụ NCDC. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ụjọ bara ya ahụ maka mmekọ ya na nwoke ahụ mana o wezugara onwe ya iche maa mee ihe ndị o kwesịrị ka ọ hara ibute ọrịa a. Amarachukwu sị na kamgbe ahụ na ọtụtụ ndị mmadụ na-ekele ya n'ebe ọ dị ukwuu maka mbọ ọ gbara ịchọpụta nwoke a. Ọrụ a si n'aka Jessica Nwankwo na Chiemela Peter. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52616535 +sports Burnley vs Man City: Aguero edowela City n'ụzọ irite iko Premier League ọzọ "Akụkọ dị mkpa taa Manchester City ka nọ n'ụzọ ịtụ ugo n'asọmpị Premier League nke 2019 ka goolu Sergio Aguero nyere ha mmeri na nzute ha na Burnley na ọgbo egwuregwu Turf Moor. Igwe Bekee kpọrọ ""goal-line technology"" bu ihe eji kpebie na nrịba bọọlụ Aguero ziri ezi. Nke a goosiri etu ya bu asọmpi siri gaa - Man City abịaghị ka ndị zuru ka emee. Burnley haziri onwe ha ọfụma nke, mana ọ bụ Man City ka mmeri bara n'aka ka onye na-egbu asọmpi ahụ gbuchiri ya. Man City ga-anabata Burnley na be ha, ma gakwuru Brighton n'izu na-abịa. Ha merie asọmpi abụọ, iko ga-abu nke ha. Ndị agha Naịjirịa ezipula ndị otu ha na Gombe ka ha kwado mmachi amachiri ngagharị na steeti ahụ kemgbe Satọde. Onye nọchite odeakwụkwọ steeti ahụ bụ James Pisajih sị na nke a bụ ka egbochie ọgbaaghara nwere ike ịsochi ụmụaka ndị Boys Brigade nwụrụ n'izu gara aga. Otu ọmekataraihe pụụjọ bụ IS sị na ha egbuola ndị agha Naịjirịa mmadụ iri na kpụta otu onye ọzọ na ndụ na Borno steeti ụnyahụ. Ndị omekome a kwuru na ha wakporo obi ndị agha Naịjirịa dị na Sabon Gari bụ nke dị na oteaka Maiduguri bụ isiobodo steeti ahụ bụ ebe ha butere ma mebie ọtụtụ ngwaagha. N'ofesi e, ndị uweojii obi dị inu awakpoola ọdọ ndị omekome bụ ndị ha sị na tụrụ ogbunigwe gburu ọtụtụ mmadụ na Sri Lanka tata bụ ụka. Gọọmentị mba ahụ amachiela ya bụ otu akpọrọ Thawheedh Jamaath na be ha." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48084080 +sports Chelsea vs Leicester City: Leicester City anapụla Chelsea iko FA ma bunye ha iko anya mmiri "A gbawala m aka bụzi ekpere ndị Chelsea na-ekpe ugbua dịka Leicester ji otu ọkpụ gbajie ha aka ma naara ha iko FA. Nke a tụrụ Chelsea na ndị nkwado ha n'anya maka na ebumnobi ha bụ imeri asọmpi a. Leicester nyere goolu ha ji merie na nkeji 63' site n'aka Youri Tielemans. Chelsea gbara mbọ ịsa goolu ahụ mana obi gbawara ha mgbe ogbu pịpịrọ kagburu goolu sị na ọ bụ 'offside'. Nke a mere anya mmiri jiri jupụta otu egwuregwu Chelsea na ndị nkwado ha n'anya dịka e gbuchiri bọọlụ na nkeji 90'. Ụmụafọ Naịjirịa abụọ na-agbara Leicester bọọlụ bụ Kelechi Iheanacho na Wilfred Ndidi gosipụtara obi ụtọ ha na mmeri a. A na-atụbu anya na Chelsea nwereike ịmabute iko abụọ gụnyere FA na Champions League mana mmeri a akachapụla nke ahụ. Ugbua ekpere ndị Chelsea ga-abụzi ""Agbawala m aka iko n'afọ a"" dịka ha ga-ezute Manchester City n'asọmpi ikpeazụ nke Champions League." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57130630 +health Coronavirus Lockdown: Etu ị ga-esi kwado dika a sị ka a nọdụ n'ụlọ Ndị Igbo na-asị na nkwụcha abụghị ụjọ. Dịka gọọmenti steeti ụfọdụ na Naịjirịa na-akwado ịsị ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ maka igbochi mfesa coronavirus, ọ ga-adị mma ka ị mara etu ị ga-esi kwado ka ihe ghara iribido gị na ndị be gị. Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ikuziri ndị mmadụ etu e si ebi ndụ zuruoke bụ Rajiv Sharma kọwara ihe anọ mmadụ ga-eme iji chebiri mgbe a ga-asị onye ọbụla nọrọ n'ụlọ. Sharma kwuru na ọ dị mma ka ndị mmadụ kwụsị ige maọbụ ikesa akụkọ ụgha gbasara ọrịa coronavirus. O kwuru na kama ime nke a, tinye uchu n'ime ihe ga-egbochi ya bụ ọrịa ịbata n'ahụ gị site n'iwepụ ụjọ. Jide obi gị aka. 2. Na-eri mkpuru osisi ọfụma Sharma dụrụ ọdụ ka ndị mmadụ rie mpkuru osisi dịka oroma, , kiwi, oroma, nkịrịsị, guava, grapefruit, akwụkwọ nri dịka broccoli, cauliflower, Brussel sprouts na capsicums nke gụnyere vitamin C. O kwuru na ọ dịmma iri nri Alkaline ya karịrị asidi ọrịa ahụ na-ebute. Ụfọdụ nri ndị a gunyere Lemon, Lime, Avocado, Garlic Mango, Tangerine, Pineapple, Dandelion, Oroma nkịrịsị. 3 Na-akwọsi aka ike akwụsị akwụsị Sharma kwuru ka ndị mmadụ na-akwọ aka ha mgbe ọbụla ghara iji makana asị ka a nọdụ n'ụlọ kwụsị ime nke a. Were kemikalụ na-egbu nje wee na-agbagasị na bee gị. Kpuru akwa eji ekpuchi ihu maọbụrụ na ịgaghị ahapụ imetụ aka n'ihu. Kpesara ndị na-ahụ maka ịchọpụta onye ọrịa coronavirus ji ma ọ bụrụ na onye nọ n'akụkụ gị na-egosi na ha bu ọrịa ahụ. Ịmaghị ndụ onye inwere ike ịzọ site n'ime nke a. 5. Gokọta ihe ndị ga-abara gị uru Nwaane gbaa mbọ gote ihe nri ga-anọteturu gị na ndị be gị aka n'oge ahụ ịnọ n'ụlọ. Gote mmiri ọṅụnụ, ncha na ihe ndị ọzọ eji ehicha ụlọ nakwa ihe nri. Gote ụmụ ihe egwuregwu ga-enyere ụmụ gị aka izu ike ọfụma. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51957559 +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Atletico etiela Arsenal mmonwu Atletico Madrid akwatuola Unai Emery na International Champions Aka gbajiri onye na-achịkọta otu Arsenal bụ Unai Emery n'asọmpi ya nke mbụ o du ha ga. Atletico Madrid ji ọkpụ atọ a satara otu tie Arsenal mmonwu n'asọmpí International Champions na-eme ugbua. Willie Obiano ọ chụọla ndị ọrụ ya? Mmadụ isii sọ na ndị isi oche ọchịchị ime obodo n'Anambra bụ ndị akụkọ kwuru na a sị ka ha kwara ngwonwgo ha laba maka aka na-achị steeti ahụ bụ Willie Obiano sị na ya chọrọ ndị ọhụrụ. Mara na ndị nwere olileanya na ha ga-eso zọọ ndọrọndọrọ ọkwa ọzọ na ntuliaka a ga-eme na 2019, kwesiri iritu n'oche tupu ha bido njem ndọrọndọrọ. Ọchịchịrị ga-ekpuchi ọnwa taa Ọchịchịrị ga-ekpuchi ọnwa kpam kpam taa site n'elekere itoolu ruo iri na otu nke abalị taa. Ọkammụta Augustine Ubachukwu bụ onyeisi 'Astronomy and Astrophysics Research Group' na mahadum Nsukka na-ezipu ozi nkea. Nọt Koria ebunyela ndị Amerika ozu ndịagha ha Onyeisiala Nọt Koria bụ Kim Jon Un, nyere Amerika ozu ndị agha Amerịka nwụrụ na agha Koria nke mere n'etiti afọ 1950 na 1953. Onyeisiala Amerika bụ Donald Trump kelere Kim maka omume mana o kwuru na ndị agha ala ha karịrị puku isii ka na chọ n'ala Nọt Koria. Gee akụkọ anyị n'ụtụtụ a Lee ihe onyonyo anyị https://www.bbc.com/igbo/afirika-44978763 +health Coronavirus symptoms: Kedụ njirimara ya m ga na-ahụ kpoku NCDC? "Coronavirus na agbasa n'ike na ebube ebe o dulagoro mmadụ 128,886 mụọ ma jidekwa ihe karịrị nde mmadụ abụọ n'ụwa. Covid-19 na-ejide n'ume maọbụ ngụgụ. Ọ na-egosipụta site na ahụọkụ nakwa n'ise ụkwara esepuaka. Ụkwara ntịrịrị anaghị akwapụta ihe ọbụla dịka imi. Ọ na-akpọ nkụ, dịka ụlọọrụ British National Health Services dere. Ụkwara esepụaka bụ mmadụ ịkwa ụkwara mgbe niile karịa otu awa, ụdị ihe ahụ mee mmadu ụgbọrọ atọ n'otu ụbọchị. Ụkwara a were ike ikanjọ karịa otu o si emebu onye ahụ. Nke a nwere ike ibute ume ibi mmadu, mee ọ di onye ahu ka eji udọ kechie obi ya nke ga-ebutere ya obi mgbu. Onye ahụ nwere ike ị nwe ahụọkụ maọbụru na ahụ ya na-ekpo ọkụ karịa 37.8C. Nke a nwere ike ịme ka ahụ kpowe ọkụ maọbụ oyi mawa onye ahụ maọbụkwa oyiọmụma. Ụfọdụ ndị ya bụ ihe mere sị na ọ na-ebutekwa akpịrị ịkpọnkụ, isi ọwụwa maọbu afọ ọsịsa. Mgbe ụfọdụ onye ahu agaghịzị anụ isi maọbụ nụ ụtọ nrị. Njirimara ndị a nwere ike ịgosipụtawa n'abalị ise mana ọ bụ akarịa na ndị ụfọdụ. World Health Organisation (WHO) sị na o nwere ike izo abali iri na anọ (14) n'ahụ mmadụ tupu ọ pụta ihe. Nchọpụta ndị British Medical Journal gosiri na Covid-19 anaghị egosipụta na ahụ mmadu ruru pasent iri asaa na asatọ (78%) maọbụ ọnọdụ nke Bekee kpọrọ asymptomatic. Nchọpụta a kwenyere na ihe ahụrụ na Ịtali bụ ebe ọrịa nyụrụ ndị mmadụ ịkpakwụ bụ nke gosiri na mmadụ dị na agbata pasenti iri ise rụọ iri asaa na ise (50% - 75%) egosidghị njirimara ya bụ ọrịa ma ọli dika ya bụ ọrịa di ire n'ahụ ha ma sikwa n'ahụ ndị ahụ banye n'ahụ ndị ọzọ. Nchọpụta ọzọ emekwara na Iceland gosikwara na ihe dịka mmadụ iri ise (50%) bụ ndị bu ya bụ ọrịa enweghị njirimara ya. Agbanyeghị, nchọpụta WHO mere ndị ọrịa a dị mmadụ 56,000 gosikwara: Mmadụ ruru pasenti iri asatọ (80%) ji ntakịrị isi ọwụwa, oyi na ụmeọkụ (pneumonia).egosi ya. Pasenti iri na anọ (14%) ndị ọzọ na-enwe ezigbo nsogbu njirimara dịka ume ibi onye ahụ maọbụ ekudaghị ume nke ọma. Pasenti isii ndị ọzọ bụ ndị ume ha dagoro mba maọbụ ime ahụ ha juziri ịrụ ọrụ, bụ nke na-ebute ọnwụ. Ọtụtụ ndi nje a bara ahụ na-agbake ngwangwa ma ha zuo ike maọbu ṅụọ ọgwụ dịka paracetamol maọbụ nke Bekee kpọkwara acetaminophen. Ọbụrụ na ị nwewe ahụọkụ, ụkwara maọbu umeọkụ were ọsọ were ije kpọwa ndị ọkachamara, maka ọnwekwara ike ọ bụru ọrịa umeọkụ maọbụ ọrịa ọkpọnkụ ndị ọzọ bụ ihe ahụ. WHO sị gị kpọtụru ndị ọrụahụike ka ha gwa gị ebe ị ga-aga maka na enwere ike ohere agaghị adị ebe nke ị chọro i ga maka ihe na-ada ebe niile ugbua. Ihe kacha mkpa n'ime ihe ịkwesiri iji ga ụlọọgwụ bụ maka ume obibi. Ndị Dọkịnta ga-enyocha gị ngụgụ gị mara ka o si didebe njọ. Ọ bụrụ na ọ dị ezigbo njọ mara na enwere ike i sị onye ahụ bịa nagalaba gbatagbata Bekee kpọrọ intesive care unit (ICU) bụ ebe a na-elekọta ndị o ji na njọ. Ekwesiri itinye onye Coronavirus ji ikuku (Oxygen) nke gụnyere akwa mkpuchi imi maọbụ tubu ọ ga-eji na-ekute ume site n'imi. Maọbụ o sie ike, enwere ike iji ngwaọrụ akpọrọ 'Ventilato'r mee ka ikuku sị na ọnụ ma n'imi na-aba onye ahụ ngụgụ. Mgbe ụfọdụ, agbawa onye ahụ onu si ebe ahụ nyewa ya ikuku. Ndị nka, ndị nweburu ọrịa ""asmtha"", ọrịa suga na ọrịa obi ka ọrịa nwere ike ịka njo n'ahụ. Achọpụtakwara na ya bụ ọrịa na-aka egbu ụmụnwoke karịa ụmụ nwaanyị. Ọ bụrụ na ya bụ ọrịa ejisighị onye ahụ ike, ọ nwere ike ịgbake n'abalị ole maọbụ ole. Mana ọ bụrụ na o ruru nke onye ahụ ịga ICU, onwekwara ike irucha otu ọnwa tupu ọ nwete onwe ya. Nchọpụta edere na akwụkwọ ndị The Lancet Infectious Diseases na akọwa na naanị mmadụ pasenti 0.66 bụ ndị ọrịa a ji, ka onwere ike igbu. Nke a erughị ka ndị ọrịa 'flu' na-egbu bụ ndị dị pasenti 0.1%. Ihe nwere ike ikponye aja na garị ọnụọgụ a bụ na ọbụghị mmadụ niile ya bụ ọrịa metutere ka agụchara. Ụzọ ka mma bụ iji mmiri na-agba agba na ncha kwọsie aka gị ike mgbe niile. Coronavirus na-agbasa site n'ọnụ mmịrị maọbụ imi onye bu ya, mgbe ọ mara uzere maọbụ kwaa ukwara. Mmadụ nwere ike ikuru ya n'ume mgbe ọ nọ n'ikuku maọbu biri ya n'aka mgbe ọ nọ n'elu ihe ọbụla imeturu aka were si otu ahụ banye onye ahụ n'imi, ọnụ maọbụ n'anya. Yaa bụ, iji tishu kwanye ụkwara maọbụ maa uzere, imetu aka ịkwọghị akwọ n'ihu nakwa ịnọpu anọpụ mgbe gị na onye bụ ya nọ di mkpa karịa. Ndị bụ nje a nwere ike ife ya mmadụ mgbe ha ka na-egosi njirimara ya ebe ụfọdu nwere ike ịmalite ifesasị ya tupu ha adaa ọria. Akwamkpuchi ihu abụghị ihe kacha mma iji gbochie ọrịa a, dịka ndị ọkachamara si ekwu. Agbanyeghị, WHO ka na-elebe anya ịmata ka ndị mmadụ aga erita uru na ya maka na ọ nwere ike ịme ka asọmmiri maọbụ imi si onye bu ya n'ọnụ maọbụ imi ghara ịtụsa n'ebe ọzọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52302289 +sports 2019 Women World Cup: Thailand ji nkata kpojuo goolu taa Otu boolụ ụmụnwaanyị Sweden ji mba Thailand mere ihe ọchị taa dịka ha ji okpu goolu ise dọrie neetị ha. Onye malitere ihe a bụ Linda Sembrant na nkeji 6 n'agba nke mbụ n'asọmpị ahụ. Ndị ọzọ nyekwara goolu bụ Kosovare Aslani, Fridolina Rolfo, Linda Huritg na Elin Rubensson. Kanjana Sungngoen gbalịrị ịzọpụta ndị Thailand na nkeji 91 mgbe o nyere ọkpụ goolu mana o nweghi isi. Nke a ga-eme ya ugboro abụọ a na-emeri mba Thailand n'Iko mbaụwa ụmụnwaanyị nke afọ a. Cheta na mba USA ji ọkpụ goolu iri na atọ merie ha n'asọmpi mbụ ha. Ọ pụtara na ha nwereike ịlawa na ngwụcha agba nke mbụ a. Ha na mba Chile ga-ezute onwe ha n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Juun. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48657264 +religion Father Mbaka: Ekpere m ekpere, buo ọnụ ọtụtụ ụbọchị ruo mgbe amụma Hope Uzodinma mezuru Ụkọchukwu na-elekọta 'Adọration Ministry' Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ekwuola na ya nọ n'ụlọ ekpere ya na-erighi nri ọbụla ganye na Ụlọikpe Ukwu ekwuo na Hope Uzodimma emeriela dịka gọvanọ Imo Steeti. Fada Mbaka onye guzobere ụka ịtụ mmamma maka mmezu amụma o buru ụbọchị 31 nke ọnwa Decemba 2019 kwuru na obi dị ya mma na Hope bụ onye ga-azọpụta ndị Imo steeti. Ọ gwara ndị Imo ka ha nye Hope afọ abụọ nke ọ ga ejị dozigharịa obodo ahụ. Mbaka dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha sepụ aka ka ha si akọ ya ọnụ na Soshal midia n'ihi na amụma ya na ebụ bụ ọ natara chi ọbụghị nke a kpara akpa. Okwuru na obi adịghị ya mma na ndị ụka katọliki sozi na akatọ ya kama ha ga na-eto ya maka ọrụ ebube chukwu na-arụ site n'aka ya. Mbaka sị na ọdịda Emeka Ihedioha dara bụ maka ịkpọchị ntị ya n'amụma, wee kwuo na kama Ihedioha gaara ịbịakwute ya ka o busiri amuma ahụ, ọ gara kwuo na onweghị ihe oji ya kpọrọ. Ọ gbarụrụ ihu kwuo na ndị niile na akpọ gani gani ka a chụpụ ya n'ụka katọliki agbajọọla ya n'ihi na onweghi ike ịmechi ọnụ ya ma amụma bata n'ime ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ngagharịiwe amalitela n'Abuja maka Emeka Ihedioha Ganduje na Tambuwal enweela mmeri n'Ụlọikpe Ukwu 'E libeghi nna m makana ụmụnne m ndị nwoke anọghị ya' https://www.bbc.com/igbo/afirika-51178109 +sports Chelsea vs Newcastle: Chelsea ji otu ọkpụ goolu gbalahụ ihere n'aka ndị Newcastle "Chelsea ji otu ọkpụ goolu gbalahụ ihere n'aka Newcastle United n'asọmpi mbụ ha kemgbe gọoment UK chụpụchara onyeisi ha bụ Roman Abramovich. Ya bụ goolụ ha nyere bụ nke nzọpụta dịka ya bụ egwuregwu fọrọ nwa ntịị ka o mechie mgbe Kai Havertz jiri tinye ya n'azụ neetị na nkeji 88. Ya bụ asọmpi tara akpụ nke bụ na otu egwu bọọlụ abụọ ahụ kwechiiri rụọ mgbe Chelsea nyere goolu ahụ. Dịka ọ dị mgbe Chelsea gbara Norwich ọkpụ atọ n'izu gara aga, ụfọdụ ndị nsonso ha gụwaara Abramovich egwu nwa mgbe nta tupu ha mechie ọnụ. Chelsea ka yikwa uwe 3 ha gbaa bọọlụ taa. Thomas Tuchel bụ onye nkuzi otu Chelsea ekwuola na enweghi ebe ọ na-aga maọbụghị ma 'season' o bu ụzọ gwụ. O kwuru na ọ bụ ọrụ dịịrị ya na ndị ọgbabọọlụ Chelsea ịlụtara ndị klọb ahụ ọgụ dịka Roman Abramovich bụ onye nwe ya na-agabiga nsogbu n'aka gọọmentị Briten. Anya niile dị ebe Chelsea nọ dịka ha ga-anabata Newcastle n'ọgbọegwuregwu Stamford Bridge n'ehihie Sọnde a. Nke a na-abịa dịka a ka na-akpa nkata maka orire otu egwu ahụ. Ka ọ dị ugbua, Premier League ekwuola na Roman Abramovich, onye nwe Chelsea etozughi ịbụ onye nhazi otu egwu ahụ, ka gọọmentị mba UK tụkwasịchara mmachi n'isi ya. Anya niile na-ele ịmata uwe Chelsea ga-eyi agba ya bụ bọọlụ na ihe a ga-ebi na ya, dịka ụlọọrụ 3 bụ ndị na-akwụ ụgwọ uwe ha kwuru na ha ga-akwụsịtu nwa mgbe nta. Hyundai bụkwa ndị aha ha dị n'uwe ha sokwa kwụsịtu nkwekọrịta ha na Chelsea nwere. Gọọmentị Briten kpachikwara ngwongo niile bụ nke Abramovich (gụnyere Chelsea), nke a kwụsịrị atụmatụ o nweburu ire otu egwu ahụ. Premier League kwuru na etozughi oke Abramovich ""agaghị egbochi otu egwu ahụ ime ọzụzụ nakwa ịgba asọmpi"". Iwepụ onye nwe otu egwuregwu n'ọnọdụ ntozu oke na-ebutekarị orire oke onye nwere - bụ ihe Abramovich chọburu imalite n'abalị abụọ nke ọnwa Maachị o kwuputere mmasị ya ire Chelsea dịka ndị omeiwu bu ụzọ na-ekwu okwu itinye mmachi ndị ha mechara tinye. Mmachi niile a na-abịa n'ihi na gọọmentị mba Briten na-enyo Abramovich dịka onye nwere ike iso na ndị na-akwado mwakpo Russia wakporo Ukraine. Chelsea ji pọịntị 56 nọrọ n'ogogo atọ na tebulu Premier League, ebe Newcastle United ji pọịntị 31 nọrọ n'ogogo 14. Chelsea meriri ugboro asatọ n'ime iri ikpeazụ ha zutere Newcastle. Naanị otu ugboro ka Newcastle meriri Chelsea n'ime ugboro 27 ha zutere na Stamford Bridge (nke bụ n'ọnwa Mee 2012)." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60725754 +politics Emmanuel Macron emeriela na ntuliaka ọkwa onyeisiala mba France nke ugboro abụọ "Emmanuel Macron enwetela mmeri na ntuliaka ọkwa onyeisiala ọzọ na mba France dịka ọ ga-anọ n'ọkwa ahụ ruo afọ ise ọzọ na a bịa abịa. Macron ji pasentị iri ise na asatọ wee mmerịe ogbo ya mara ya aka bụ nwaada Le Pen dịka nke a bụ ịzịzị kemgbe afọ iri abụọ onye nọbụ n'ọkwa a na-azọta ya ọzọ. Dịka o nwetere mmerị, Macron kwuru n'ọd��� Eiffel Tower na ebe ntuliaka agwụla na ọ ga-abụ ""onyeisiala nye mmadụ niile"" Ozi ya kwukwara na ọ ga-ahụ na ịdịnaotu lọghachịtere na mba France. Agbanyeghị na Le Pen e merịghị ọ nwetere ọtụtụ vootu dịka ndị mmadụ pụtara n'igwe tụnyere ya vootu. Ndị isi ọchịchị na mba dị ịcheịche n'Europe nabatara mmeri Macron. Onye isi ọchịchị na mba Germany bụ Olaf Scholz bu ụzọ kelee ya, ma-ekwupụta ba ha abụọ kwụ n'otu ebe na atụmatụ ikwado Ukraine n'agha ha na Russuia. Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden kwukwara na ya na-atụ anya na ha ""ha abụọ ga-arụkọ ọrụ"" gụnyere ịkwado Ukraine. Volodymyr Zelensky nke mba Ukraine kelere ya na mmerị ya ma kwupụta aha ya dịka ""ezigbo enyi mba anyị"". Praịm minista mba Briten bụ Boris Johnson nabatara mmeri ya dịka o zipụtere ya ozi ekele n'akara Twitter ya. N'ehihe Sọnde, Ọnụọgụgụ gsoiri na Emmanuel Macron emeriela ntuliaka onyeisiala mba France. Nke a pụtara na Macron ga-agazu afọ ise ọzọ bụ agba nke abụọ ya dịka onyeisiala mba Fransi. Ndị mba Fransi na ntuliaka a nwere ohere ịhọrọ otu onye n'etiti Emmanuel Macron bụ onyeisiala chịrịla ha afọ ise, na nwaada Marine Le Pen bụ onye na-ama ya aka. Dịka ha mechara achụmnta vootu butere nkewa n'etiti ndị otu ha, nnukwu ọrụ chere Le Pen n'ihu dịka Macron dị afọ 44 nọ n'ihu mmeri. Iji merie, ha abụọ ga-achọ vootu ndị tụnyeere ndị ọzọ so ha zọọ ọkwa n'agba nke mbụ. Mana ndị na-ahụghị Macron n'anya na-ekwu na ọ bụ onye nwere mpako ma bụrụkwa ""onyeisiala naanị ndị ọgaranya"", ebe a na-ebo ebubo na e nwere ihe jikọrọ Le Pen na Onyeisiala Vladimir Putin nke mba Rọshịa. Nke a bụ ugboro atọ Le Pen na-azọ ọkwa onyeisiala, dịka Macron meriri ya ọfụma n'agba nke abụọ n'afọ 2017. Ihe ruru mmadụ nde 48.7 ga-eso atụ vootu na ya bụ ntuliaka, ebe a ga-ebido ịmata onye na-emeri ebe elekere asatọ nke abalị Sọnde, Epreelụ 24 2022. Ebola ewelitekwala isi ọzọ na mba DR Congo Ọrịa Ebola eselitekwala isi ọzọ na mba Democratic Republic of Congo, dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) si kwuo. N'agbanyeghi na ọ bụ naanị otu onye ka a chọtarala ya bụ ọrịa n'ahụ ya, a na-atụ ụjọ na ọ nwereike ifesa, n'ihi na a chọpụtaghị ya ọsịsọ ma wepụ onye ahụ o mechara gbuo, iche. Ya bụ nwoke butere ọrịa a rịara ọrịa ihe karịrị otu izu tupu e buru ya gawa ụlọọgwụ, ọ nwụrụ ụbọchị o ruru ụlọọgwụ. Ọrịa a selitere isi nke ugbua n'obodo Mbandaka bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ bi ma dịrịkwa nso isiobodo mba ahụ bụ Kinshasa. Cheta na ọrịa a gburu ihe ruru mmadụ otu puku na narị anọ (1,400) na mba DR Congo mgbe o selitere isi n'afọ 2019. Nke a bụkwanụ nke ugboro isii ọrịa Ebola na-eselite isi na mba DR Congo kemgbe afọ 2018 (nke bụ na ndị ọrụ ahụike ha amarala ihe ọrụ nyịrị ibuso ya agha, ha nwekwara ọtụtụ ọgwụ mgbochi e mepụtara maka ya). Mgbe ikpeazụ Ebola selitere isi na mba ahụ, o gburu mmadụ isii n'ime mmadụ 11 butere ya, a na-enwe olileanya na a ga-egbochinwu nselite isi ọrịa a etu e si buso nke a agha. Mkpamkpa Ebola kpara butere ọnwụ ihe ruru mmadụ puku iri na otu (11,000) na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka n'etiti afọ 2013 ruo 2015 (ya bụ ọrịa na-egbu ihe ruru mmadụ 50% butere ya). Fiona Braka bụ onyeisi ngalaba gbatagbata nke WHO n'Afrịka, kwuru na igbu oge na nlekọta ahụike bụ ihe na-enye nchekasị. O kwuru ""Ọ dị ezigbo mkpa na anyị chọtara ndị niile ha na nwoke ahụ nwere mmekọ ma malite nnyocha na iwepụ ha iche, iji gbochie mfesa ọrịa a site n'ịchọta ma e nwere ndị butere ya."" A malitela ịchọ ndị ha na nwoke a nwere mmekọ n'ike n'ike." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61200240 +business Ọgba mbọ: 'Inyere ụmụnwaanyị aka mere m ji malite ụlọọrụ ime isi' N'agbanyeghi na ọ mụghị etu e si eme isi maọbu wig, Chinyere Anigbo bụ dọkịnta ahụike gbanyụrụ ọkụ n'ọrụ ya wee malite ịrụpụta wig. Taa, ọ na-ebu wig ya aga mba ụwa dị iche iche. O nwere ndị ọrụ karịrị narị anọ ọkachasị n'ụmụnwaanyị, ọ sị na ọ bụ iji nyere ha aka mere o ji malite ọrụ ịrụpụta ntụtụ a na-ekpu ekpu bụ wig. N'akụkọ a, ọ kowara etu o si malite nakwa etu o si aga. Ọ bụ Chimezie Ucheagbo na Nnamdi Agbanelo tinyere aka mee akụkọ a https://www.bbc.com/igbo/afirika-55399251 +politics Uche Nwosu: E resịghị m ọgọ nwoke Rochas Okorocha ala Imo "Kemgbe ọ hapụrụ ọchịchị na 2020, Uche Nwosu na ezinaụlọ ya agabigala ọtụtụ ihe n'Imo steeti. E bola ya na ndị be ya ọtụtụ ebubo nke gụnyere ịwere ala ndị mmadụ n'ike nakwa ịweghara ihe ndị steeti ahụ. Nke ikpeazụ bụ mnwuchi ndị uweojii nọ na obi gọọmenti Imo steeti nwuchiri ya n'ụbọchị iri abụọ na isii, ọnwa Disemba 2021 n'ụlọ ụka St. Peters Church, Eziama dị na Nkwere, Imo steeti. Ndị otu a batara n'ime ụlọ ụka gbaliwe egbe elu, kpọrọ Maazi Nwosu gbalaga. Gọomentị Imo steeti agọọla na aka ha adịghị na ya bụ mnwuchi maọlị. Uche Nwosu gwara BBC Igbo ihe ya hụrụ ụbọchị ụka ahụ bụkwa ụbọchị ọ kaara nne ya nwụrụ anwụ ụka. Ọ sị na ndị bịara ya bụ njem e gosighị ya akwụkwọ ikike ha ji bịa ịjide ya. O kọkwara ka ha sị yipu ya akwa ya mee ya akaje n'ihu ọha mmadụ. BBC jụkwara ya maka ebubo ala niile a na-ebo ya na steeti ahụ. Nwosu sị na ọ nweghị ala mmadụ maọbụ nke steeti ya na ọ gọ ya nwoke bụ Rochas Okorocha nweere. O kwuru maka ala ebe nwunye Okorocha rụrụ Royal Sping Palace bụ nke ọ sị na ""Ọ bụghị oge nke m ka e nyere ya ala ahụ. A chịchala ọchịchị tupu enye ha ala"". O kwuru na ihe dị iche na gọọmentị Uzodimma na nke Rochas bụ na gọọmentị ka diri ndị mmadụ nso mgbe Rochas karịa ugbua. O kwukwara na ihe kacha mkpa ugbua na steeti ahụ bụ udo na ihunanaya bụ nke kọrọ ụkọ ugbua. O kwuru na ihe ka ya njọ bụ mmebọ e mebọrọ ya n'ụlọ ụka ụbọchị ya na eru uju nne ya. Father Cliford Eze kọwara ka ihe siri mee n'ụbọchị ahụ na ka obodo siri gbakasie mgbe ndị uweojii ahụ gbawara egbe. Uche Nwosu bụ onye so dọọ ọkwa Gọvanọ Imo steeti na ntuliaka 2020. O ji okoloto Action Alliance, AA, zọọ ọkwa ahụ. Ọ bụ ọgọ Gọvanọ na-achị mgbe ahụ bụ Rochas Okorocha. Ọ rụrụ ọrụ na gọọmentị Okorocha dịka: Osote onye nlekọta ndị ọrụ oyibo (Depty Chief of staff) - 2011 - 2013 Kọmishọna na-ahụ maka ala (Commissioner for lands) - 2013 - 2015 Onyeisi nlekọta ndị ọrụ oyibo (Chief of Staff) - 2015 - 2019 Gọọmentị Hope Uzodinma na ọchịchị nke Okorocha ha adịghị na mma kemgbe ụtụtụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60192088 +politics Imo State Isopadec: Ihe mere gọọmentị Imo steeti ji chụọ mmadụ 108 n'ọrụ "Aka na achi steetI Imo bụ Hope Uzodinma achụọla mmadu di otu nari na asatọ bụ ndi ụlọọrụ 'Imo State Oil Producing Areas Development Commssion' (ISOPADEC.) Ozi si na aka Gomenti Imo kwuru na ihe kpatara e ji chụọ ndị ahụ bụ maka na e si n'azụ ụlọ wee ha n'ọrụ oge Rochas Okorocha nọ n'ọchịchị. Ọnụ na-ekwuru ISOPADEC bụ Ekeh Promise Onyekachi kwenyere na esi n'ụzọ iwu na akwadoghi wee ndị ahụ n'ọrụ. Onyekachi kwukwara na sọsọ ọchụchụ a chụrụ ndị ọrụ agaghi ewetacha mgbanwe tọrọ atọ na ya bụ ulọ ọrụ. Otu onye n'ime ndi ọrụ a achụrụ achụ aha ya bụ Ifereze Victor, katọrọ agwa gọmeenti imo kpara. O kwuru na esi n'ụzọ iwu kwadoro wee ha n'ọrụ. Ifereze Victor kwuru na ọtụtụ n'ime ha bụ ndị obodo ebe e si amịta mmanụ nakwa gaasị nke na-enye Imo steeti ego. ""O kwesịghị ka anyị bụ ndị obodo ebe e si amịta mmanụ bụrụ ndị na-enweghị ọrụ,"" Ifereze Victor na-ekwu. Cheta na ndị ọrụ ISOPADEC nọrọ n'izụka olemole gara aga mee ngaghari mkpesa, gba abụbụ ọrụ, ma gbachie isi ụlọ ha di n'Owerri n'ihi nchabi ụgwọ ọnwa ha nakwa ụgwọ ochie nke gọọmentị ji ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56133446 +sports AFCON: Lee ka o si aga n'Egypt Tọọzde na foto Onye nchịkọta otu Super Eagles bụ Gernot Rohr na ndị ọrụ ya ndị ọzọ zochiri n'ama egwuregwu Alexandrian dị na mba Ijipt ile asọmpị ndị Madagascar na ndị Burundi gbara ụbọchị Tọọzde. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48793740 +politics Rev Father Mbaka: Ndị chọrọ ka Buhari nwụọ ga-ebu ya ụzọ nwụọ "Ụkọchukwu Ejike Mbaka bụ onyeisi ụka Adoration dị n'Enugwu ekwuola na Onyeisiala Muhammadu Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa. Mbaka kwuru nke a ụbọchị Wenezde n'ọgbakọ ofufe nru ọ na-ehiwe kwa izuụka n'ogige Adọration dị n' Umuchigbo Iji-Nike, Emene, Enugwu. Fada Mbaka sị na o ruru afọ 16 ndị chịburu Naịjirịa mbụ ji mebicha obodo ma kwukwaa na ndị mmadụ chọziri ka Buhari jiri afọ ole na ole mezie ihe niile. ""Ndị mmadụ na-akọ m ọnụ na m na-akwado Buhari ka a ga-asị na Buhari adịghị eme ọfụma."" Mbaka gara n'ihu sị na ọchịchị Buhari ga-adị, na ndị chọrọ ka ọ nwụọ ga-ebu ya ụzọ nwụọ. Ọ sị na ya ma na ọ bụ Buahri nọ n'Asọ Rock makana ọ na-echeta nkata ha abụọ kpara tupu ọ bụrụ onyeisiala. N'okwu banyere ndị na-achi ehi, Mbaka sị na ya nwere ehi, nke mere ya onye ọchịehi. Lee ihe 20 gbara ọkpụrụkpụ ndị ọzọ o kwuru n' ozi ya: 1. Buhari abụghị nsogbu anyị, ndị Buhari bụụrụ nsogbu bụ ndị na-ezufu ego 2. Buhari abụghị nsogbu Ndigbo. Kedụ mgbe Buhari banyere n'ọchịchị Naịjịria? 3. Jonathan enyere Igbo Biafra, Buhari jụ inye ụnụ ya? Obasanjo enyere Igbo Biafra, Buhari jụ inye ụnụ ya? Ken Nnamanị bụ onyeisi Sineti, o nyere ụnụ Biafra? 4. N'ọrụ ugbo, Naijiria na-alaghachi ugbua na ị bụ ebe e jiri ịkọpụta ihe ubị mara n'Afrịka 5. Ihe e mebiri n'afọ 16, agaghị edozili ya n'otu afọ 6. Onye bụbụ Mịnịsta Mmanụ bụ Dieaziani ọ bụ na ọ bụghị onye Igbo na-alụ ya? 7. Ndị gọvanọ chọọ ụzọ ha ga-esi gboo mkpa nchekwa na steeti ha, ọ bụghị Buhari ga-abịa gburu gị anwụ. 8. E kwuru m ka a ghara ime ngagharịiwe maka Fada Offu e gburu ma ọ bụrụ na e meghị nchọpụta ka e were hụ ihe a gbadoro ụkwụ. 9. Esonyeghị m mee ngagharịiwe n'agbanyeghị na m bere akwa maka ogbugbu ya. 10. Ndị wepụtara foto sị na ọ bụ m ebe m so eme ngaharịiwe maka ogbugbu Fada Paul Offu ga-ata ahụhụ. 11. E nwere ndị Fulani bụ ndị ajọ mmadụ na-ememila ndị mmadụ mana ha abụghị ndị ọchịehi. E nwekwara ndị ọchiehi na-eme ihe ọjọọ, 12. E nwekwara ndị Igbo bụ ajọ mmadụ bụ ndị ntọ, ọ bụghị naanị ndị Fulanị 13. Anyị nwere nnukwu nsogbu nke ihe ga-egbo ya bụ inwe ọrụ. 14. Ụfọdụ ndị gọvanọ ga-ezufucha ego, ha agaghị akwụ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ. 15 Gọvanọ ọbụla bụ onyeisi nchekwa steeti ya, ha na-ata ego nchekwa kwa ọnwa maka nke a. Kedụ ihe ha ji ya eme? 16. Ndị uweojii na-ejichi ndị Keke na-anapụ ha ego n'ike ọ bụ Buhari na-eme nke a? A na-eme ya n'Ugwu Awụsa? 17. Bịafra, Bịafra, enye Ndigbo Bịafra ugbua, a sị anyị nweta onyeisiala, ndị Anambara a ga-ekwe ndị Imo? Ndị Imo aga-ekwe ndị Enugwu? Ndị Enugwu aga-ekwe onye Ebonyi? Abịa aga-ekwe Imo? 18. Ọ bụrụ na m bụ Ịmam ndị Ugwu, ndị Ugwu ga-echekwa m. Ọ bụrụ na m bụ ụkọchukwu ndị Ọdịda Anyanwụ, ndị Yoruba ga-echekwa m. Igbo nwere eze na-egbu onwe ha. 19. Ha chọrọ igbu Fada Mbaka ka ha bo ya ndị Fulani. 20. Ndị na-eti Biafra Biafra na-egbu oge ụnụ, na-anapụ ụnụ ego." https://www.bbc.com/igbo/afirika-49355341 +politics Nnamdi Kanu: Etu e si tọhapụ Maria Ezediaro ndị uweojii nwụchiri maka ịkwado onye ndu Ipob "A tọhapụla otu nnenwaanyị e jichiri kemgbe otu afọ maka ịkwado Nnamdi Kanu, onye ndu otu nnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob). Ndị uweojii pụrụ iche nke Abba Kyari bụ onyeuweojii a kwusịị ọrụ n'ike nọbu n'isi ya nwụchiri Oriaku Maria Ezediaro na ndị ọzọ n'Imo steeti afọ gara aha kpụrụ ya gaa Abuja ebe a kpochiri ya n'ogige ha rue ụbọchị Tozde a tohapụrụ ya. N'ozi nke Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu wepụtara ụbọchị ọzde, o kwuru na nntọhapụ Ezediaro sochiri akwụkwọ ya tinyere n'ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja . Ejofor kwuru sị, "" Anyị tinyere akwụkwọ n'ụlọikpe na-ekwu ka enye ya ikike dịrị ya dịka mmadụ, nwagwagwa ahụ ndị IRt gbara ọsọ kpụpụ ya n'ụlọikpe na-ebo ya ebubo achịtaghị aja."" ""Na-agbayeghị nke a, Iwu mala Naijirai wụrụ ha ụkwụ n'ala ma nye iwu ka adọghapụ nwaanyị ahụ na-eneyghị ọnọdụ ọbụla."" Cheta na a nwuchiela ọtụtụ ndị mmadụ a na-ebo ebubo na- ha na-akwado Nnamdi Kanu maọbụ nnwereonwe Biafra kemgbe mkpu Biafra rịwa elu ọzọ kemgbe afọ 2015. N'afọ 2017, gọọmentị Naijiria machiri otu Ipob so n'otu bu iti mkpu nnwereonwe Biafra n'isi ma gunye ha n'otu oyinduegwu (terrorist group)." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61186263 +business "Ogbogwu Market Fire: ""A ka na-achọ mmadụ abụọ achọ n’ọkụ gbara n’ahịa a""" "Chinedu Ezekweike bụ onyeisi ndị na-azụ ahịa n’Ogbogwu dị n’Onitsha Anambra Steeti ekwuola na ha ka na-achọ mmadụ abụọ achọ kamgbe ọkụ gbachara n’ahịa ahụ n’ụbọchị Tuzde. O kwuru nke a mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ na Fraịde 11th Nọvemba 2022, ịhụ ka ọnọdụ ebe ahụ si dị kamgbe ahụ. Ezekweike sị na ọnụọgụgụ ndị nwụrụla eruola ihe dịka asaa ebe ndị merụrụ ahụ karịrị asaa. “I lee anya ị ga-ahụ na anyị ka na-agba mbọ, ịkpochapụta ụlọ ndị a dara ada iji mara ma o nwere ndị tọrọ ebe ahụ. “O nwere ụmụaka abụọ bịara ebe a ma sị na ha na-achọ nne ha achọ kamgbe ahụ”. Ọ sị n’ime ndị merụrụ ahụ na a gwọọla ụfọdụ ma ha lawa n’ụlọ ha ebe ndị ọnọdụ ha dị njọ ka na-anata ọgwụgwọ. Ụlọọrụ gbata gbata bụ National Emergency Management Agency (NEMA) ngalaba Anambra Steeti ekwuola na ọ bụ mmadụ anọ nwụrụ n'ọkụ ahụ gbara n'ahịa Ogbogwu Onitsha n'ụbọchị Tuzde 8 Nọvemba 2022. Ọnụ na-ekwuru ha bụ Nwonye Chinyelu gwara BBC Igbo nke a n'ekwentị ma sị na ọnụọgụgụ ndị merụrụ ahụ karịrị iri na abụọ. O kwuru na ọnụọgụgụ a nwereike ịkarị kama na ọ bụ kọmishọna na-ahụ maka ahụike ka ọ dị n'aka ịma mmadụ ole o metụtara kpọmkwem. Chinyelu gara n'ihu kwuo na ụlọọrụ ha na-abọkaasị ogigi ahụ ugbua ịmata ma o nwere ndị tọọrọ n'ime ya bụ ụlọahịa ndị dara ada n'ihi ọkụ a. Onyeisi ahịa BridgeHead, Ọnịcha, Anambra steeti bụ Chinedu Ezegwuike, akọwaala na ọ bụ ihe ọgbụgba malitere ọkụ gbara n'ahịa Ọgbọ-ọgwụ dị na Head Bridge, Ọnịcha, ụbọchị Tuzde. O pekata mpe mmadụ anọ nwụrụ, ọtụtụ merụọ ahụ n'ọkụ gbara ọdọahịa 80 n'ahịa Ọgbọgwụ n'etiti ehihie abalị asatọ nke ọnwa Novemba afọ 2022. Na mkparịtaụka Ezegwuike gwara BBC Igbo e nwere na ahịa ahụ, ""Ebe o ji ihe dịka nkeji iri gafee Elekere iri na abụọ nke ehihie, anyị nụrụ nnukwute ihe dara ụda gbaa,kwụlie anwụrụ ọkụ."" "" Oge ihe a mere, ọgbaghara dara n'ọtụtụ ebe, ndị mmadụ na-agba ọsọ nke butere n'ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ ahụ."" O kwuru na ihe ọgbụgba ahụ zere ụlọ ndị dị na ""Gọverment Line"" bụ ebe a na-arụ kemikal n'ahịa ahụ. Ọ ga n'ihu kwuo na ha na-atụ uche na ụfọdụ ndị mmadụ nakwa ndị ahịa ka tọọrọ nokpuru ụlọ ndị dara ada. Ihu atọghị ọtụtụ ndị mmadụ na-azụ ahịa n'Ọgbọọgwụ dị na Head Bridge, Onicha, Anambra steeti taa bụ Wenezde, dịka ọtụtụ na-agụkọ ihe ọkụ ọgbụgba tara isi o pekata mpe mmadụ anọ, ma merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ riri ha. A mabeghị kpọmkwem ihe butere ọkụ ahụ maọbụ mmadụ ole nwụrụ n' ọdachị ahụ nke malitere n'ebe Elekere 12 nke etiti ehihie mana otu onye ndu n'ahịa ahụ achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na e nwetalaa ozu mmadụ anọ nwụrụ n'ọkụ ahụ. Onyeisi ụlọọrụ gọọmentị Anambra steeti na-emenyụ ọkụ bụ Martin Agbili, gbara ama na ya bụ ọdachi metụtara N’ozi mgbasaozi nke Agbili binyere aka ma wepụta n'ụbọchị Wenezde, o kwuru na ya bụ ọkụ malitere n’ọdọ ebe a na-ere kemikal na akọrọngwa sayensi n’Ọgbọ-ọgwụ. Agbịlị kọwara na ọ bụ ihe ọgbụgba gbara n'ọkụ ahụ mere ọtụtụ ụlọ dị ebe ahụ mere ji daa. ""Ọ bụ nnukwu ihe mere mana agbanyụọla ọkụ ahụ."" "" Ọ bụ ala ọmajiji so ihe gbara mere ka ụfọdụ ụlọahịa daa."" O kwukwara sị na a matabeghị mmadụ ole nwụrụ maọbụ ndị merụrụ ahụ. Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ahịa ahụ n'ụtụtụ Wenezde kwuru na ọ hụrụ ndị ahịa ya bụ ihe metụtara na ndị ọdọ nke ha dị nso na-agba mbọ ibupụ ngwahịa ha ndị fọrọ afọ dịka gọọmentị Anambara steeti kwuorola na a ga-akwatu ụlọahịa ndị ọkụ ahụ metụtara. Ka ọ dị ugbua, a ka na-achọ ndị ụlọ dagidere, ebe e bugarala ọtụtụ ndị merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ dị n'Ọnicha na Asaba, Delta Steeti. Gọọmentị Anambara steeti kwuru na ndị ọrụ gbatagbata ha amalitere ọrụ ịhụ na a zọpụta ndị tọrọ n'ụlọ ahịa ndị dara ka ọkụ ahụ gbara ma kutuo ụlọ ndị nwere ike ịda. Osote Govanọ steeti ahụ bụ Gilbert Ibezim kwuru nke a oge gara n'ebe ihe mere na mgbede Tuzde. N'aka nke ọzọ, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ pụrụ iche bụ Sly Ezeokenwa, kwuru na ọ bụ kemikal gwakọrọ were gbaa mere ka ọtụtụ ụlọ dị n'ahịa ebe ihe mere ji daa. Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ọkụ na-agba n'ahịa Ogbo ogwu dị na 'Headbridge' Onitsha. Ndị hụrụ ebe ihe mere na-ekwu na ọ bụ kemịkalụ gbapụrụ dịka ogbunigwe mana amabeghi nke bụ eziokwu. E kwukwara na ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ na ya bụ ọdachi mana amabeghi ezi ọnụọgụgụ ndị nwụrụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga ekwuola na ndị ọrụ mmenyụọkụ kwụ chịm n'ebe ahụ. N'ime ihe onyonyo ndị na-efegharị na soshal midia, ị nwereike ịhụ ebe ọkụ na-agba n'ebe akpọrọ 'Gọvernment Line' n'ahịa ahụ. Ndị ime ahịa ahụ na-ekwukwa na ọkụ ahụ malitere ịgba kemgbe etiti ụbọchị bụ elekere iri na abụọ. Mgbe BBC garuru n'ahịa ahụ, ụfọdụ ndị na-azụ ahịa n'ebe ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ bụ ebe edobere Kemikal ka ọkụ ahụ si bịa. O kwuru na ha gwara ya ebe adọsara kemịkal n'ahịa ahụ gbapụrụ dịka ogbunigwe were malite ịgba ọkụ. Otu onye hụrụ ebe ihe mere gwara BBC na ọkụ ahụ si n'ime ụlọ mapụ otu nwaanyị. Ha kwukwara na ọ kụrụ nwaanyị ọzọ n'ala ma dọwaa ntị ya. Mana onyeisi ndị ọrụ mmenyụọkụ apụtabeghi kwuo ihe ọ bụ butere ya bụ ọkụ. Kepu kepu na-ekwukwa na ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ na ya bụ ọdachi mana amabeghi ezi ọnụọgụgụ ndị nwụrụ. Ka ihe si kwụrụ ugbua, emenyụọla ọkụ ahụ na-agba ebe ndị ọdọ ah���a ha dị nso n'ebe ahụ ka na-azọpụta ngwa ahịa ha ndị fọrọnụ." https://www.bbc.com/igbo/articles/c3g8er9vv41o +sports Nigeria vs Algeria: Algeria efoola Super Eagles nku ka a na-efo ajị imi "Ọljiria ga-ezute Sịnịgal n'agba ikpeazụ dịka Riyad Mahrez ji goolu zọpụta ndị otu ya. Ebe Naịjirịa ga-ezute Tunishia ụbọchị 17 nke ọnwa Julaị, ebe ha ga-ama onye ga-agba onye nke atọ ma nweta ọlanchara. Goolu Mahrez nyere si na 'free kick' ọ gbara dịka Wilfred Ndidi gbaturu Ismael Bennacer. Odion Ighalo ji penariti nye goolu ma napụta Naịjirịa n'aka ndị Ọljiria na nkeji 73, mana o zughi ịkpọba Naịjirịa n'agba ikpeazụ. Goolu a bịara ka Aissa Mandi tinyere aka ya iji gbochie bọọlụ Oghenekaro Etebo gbara; e ji ihe nkiri Video Assistant Refree (VAR) nyochaa ya ma nye Naịjiria penariti ahụ. Goolu a Ighalo nyere bụkwa naanị nke abụọ na-abanye n'ime poostu ndị Ọljiria kemgbe ha bịara asọmpi nke afọ a. Bọọlụ biri William Troost-Ekong n'ahụ ma banye na neetị na nkeji 40, iji mee ka Ọljiria jiri otu ọkpụ na-emeri Naịjiria. Cheta na ọ bụ Troost-Ekong nyere goolu Naịjirịa ji nweta mmeri n'aka Saụt Afrịka ma banye agba ọkara-Ikpeazụ a. Ụfọdụ ndị Naịjirịa na-ewe iwe na-ekwu na ọ bụ uwe ndị Super Eagles yi mere ha ji ghara ịgbata ọfụma n'egwuregwu a. Ha gara na Twitter na-egosi iwe ha. Lee ihe ha kwuru: @sp_okpara kwuru na uwe a anaghị eweta ihe ọma. @Quadriagboola gosikwara iwe ya. @ruudboie kpọkuru ndị na-eme uwe Naịjirịa sị ha gbanwee ya makana ọ na-ebute ọdachi. Mana ajụjụ bụzị ""ọ bụ Jersey na-agba""? Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ya na Facebook anyị: Ụfọdụ ndị ọzọ malitere ịchọ Vincent Enyeama chebuuru Naịjirịa goolu. @akaninh kwukwara otu ihe ahụ. Kedụ etu obi dị gị ugbua? Ndị Super Eagles ga-eji ihe niile ha nwere gbaa egwuregwu a, enweghi ihe ọzọ ga-ebute nke a, ọ bụrụ maka nkwa ndị ojiegoachụego kwere ha maka inye ha puku dọla iri ise maka goolu ọbụla ha ga-enye." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48970858 +health Lee nri ogbenye 10 ọgaranya na-erizi "N'ala Naijiria, ihe dịka afọ iri atọ maọbụ iri anọ gara aga, a na-ahụ ụfọdụ nri dịka nri ndị ihe na-esiri ike. Ọtụtụ nri ndị a bụ nri ndị mmadụ na-enwetara onwe ha n'ugbo ha maọbụ zụta ọnụ ala n'ime ahịa n'ihi na ndị na-achọ ha adịghị ọtụtụ. Mana ugbua, nri ndị a bụzị ihe na-amasị ndị ọgaraanya n'ihi mbawanye ọrịa tara nchara dịka ọbara mgbalielụ, ọrịa shuga, ọrịa obi, ọtụrụọkara (stroke), kansa na oke ibu bụ ọrịa ndị a na-ewe dịka 'ọrịa ndị ọgaranya'. Na nchọpụta ngalaba na-ahụ maka ahụike na mba ụwa bụ WHO n'aha ịchafụ mere n'afọ 2008, ndị Naijiria pasenti 11.2 n'ime nde 169 bụ ndị nwere ọbara mgbalielụ ebe pasenti 2.7 nwere ọrịa shuga. Egwu ọrịa ndị a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji alaghachị na nri a na-eleda anya na mbụ nke mere na ugbua nrị ndịa a na-ada oke ọnụahịa nke bụ na aka ụmụogbenye anaghị eruzị ha. Lee 10 n'ime nri ndị ahụ: Ihe karịrị afọ iri atọ gara aga, a na-ahụ iji azụ 'friji' sie nri n'ụlọ ndị ogbenye, ụmụakwụkwọ maọbụ mgbe ego adịghị mmadụ n'akpa, ebe anụ ehi maọbụ anụ ọkụkọ bụ maka ndị rijuru afọ. Otu onye bi na Lagos bụ Kingsley Udofa kọwara anya a na-eleda azụ mbụ n'okwu ya sị: ""O nwere oge n'ala anyị bụ Naijiria mgbe azụ friji bụ maka ndị ogbenye. ""Oge ahụ, a na-akpọ azụ friji aha ọjọọ dị icheiche iji kwaa ya emo dịka, 'Ozu azụ' n'asụsụ Igbo; 'Ókù Ékò' n'asụsụ Yoruba nke pụtara, 'Ozu Lagos' ; 'Àkpa asuko nse' n'asụsụ Ibibio nke pụtara, 'ọ nwụrụ anwụ ma mụrụ anya.' Ndị mmadụ na-ahara ịzụ ma rie azụ ndụ."" Ugbua, egwu adagharịala. Azụ friji bụ ahụghị ma erighị nke ọtụtụ mmadụ gunyere ndị ọgaranya nke bụ na azụ na-adazị oke ọnụ n'ahịa. Dịka Mịnịsta nta na-ahụ maka ọrụugbo bụ Sen Heineken Lokpobiri siri kwuo, ndị Naijiria na-eri azụ ruru nde 3.2 metrik tọn kwa afọ nke a na-atụbata ihe karịrị pasentị iri asatọ n'ime ya. Mata na metrik tọn puku iri pụtara kọntena puku nari atọ iri atọ na anọ. Ọ bụ ede ụrị ka ọ bụ ede koko ma ọ bụ achịcha, ede bụ nri ụganị, nrị ndị onweghị ka ọra ha ji agbado ume n'ihi na ha enweghị ego zụrụ ji. Mana ugbua, nri ede bụzị ụkwa achị n'aka ya a na-agba n'ihi na oke na ngwere na-erizi ya. Ewepụ obodo jiri ụtaraede mere nnukwu nri, ndị na-asọ nsọ nrị n'ihi ọrịa dịka ọrịa shuga, ọbara mgbalielu na ndị chọrọ ịta ahụ ekweghịzị ka aka ogbenye rute ede, nke na i go ede e ji esi ofe dịzị ka igo ahịa iwu. Akpụkpọanụ ehi nke ndị Yoruba na-akpọ, 'kpọmọ', bụbu ihe ndị ogbenye ji emegharị ọnụ oge ha ahụghị ego zụrụ anụ ehi ma maọbụ anụ ọkụkọ. Dịka ihe si aga ụgbụa, ndị ọgaranya ewerela ya mee ezi nri, ebe e ji ya esi nri ọpụrụiche dịka edikakong maọbụ gwọ ya na ose ma were ya anụ mmanya. N'afọ 2014 mgbe gọọmenti si n'ọnụ onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ọrụugbo bụ Akinwumi Adesina kwuo na ha chọrọ ịmachi ndị mmadụ iri kanda nke butere oke iwe ndị mmadụ ma mekwa ka gọọmenti kpofuo atụmatụ ahụ n'ọhịa. Dịka ndị ọkachamara sị kọwa, kanda enweghị abụba maọbụ mmanụ ọjọọ a kpọrọ kọlesịtọrọl na bekee dịka anụ ehi nke ha kwuru na oke iri ya na-ebute ajọ ọrịa tara nchara dịka ọrịa obi na ọbara mgbalienu. Ụfọdụ na-akpọ ya ogede, ụfọdụ abịrịka, ndị ọzọ ojoko, ebe ọtụtụ na-akpọ ya une maọbụ unere. Ụmụ ogbenye na-eji mmanụ eri nke ahụrụ n'ọkụ, ma jiri ya sie agwa mana ugbua, ọgaranya emeela ojoko nnukwu nri. Ojoko bụ ezi nri na-edochi ahụ nihi na o nwere faiba, na mineral ndị ọzọ na-enyere ndụ aka dịka magnesium, phosphorous na potassium. Dịka ndị ọkachamara ahụike siri kọwa, ojoko na-enye ọbara mgbe e siri ya na-achaghị acha. Ma anụ adighị, azụ adịghị, ogbenye na-aba n'ọhia kpara ejula, were sie nri. Ogaranya, enwebughị efe ejula mgbe mbụ n'ihi na, dịka ndị Igbo ji ya ekwu okwu, ahụhụ dị na imecha ejula. Ma ugbua, iji ejula isi nri bụzị akara ejiri mara ọgaranya n'ihi oke ọnụ ahịa ya. Ejula bụ ezi nri nwere proten, calcium, selenium, magnesium ma na-enye ọbara. Iri garị, ọ kachasị mgbe aṅụrụ ya aṅụ, bụ ihe a na-ewe dịka nri ndị ụwa na-atụ n'ọnụ maọbụ mgbe ego kọrọ gị n'akpa na mbụ. Ị jụọ ụmụakwụkwọ bi n'ụlọakwụkwọ ha ga-akọwara gị etu ịji ọpapa, azụ e ghere eghe maọbụ anụ mkpọ aṅụ gari si zọọ ha ndụ. Ugbua garị bụzị ahịa iwu. Ọgaranya na ogbenye na-azọzị garị nke otu ọba a na-akpọ 'painter' na-ada ihe karịrị nari naira ise (N500). Onye ọkammụta ọrịa kansa n'ụlọọgwụ Lagos University Teaching Hospital, bụ Dr Remi Ajekigbe kwuru na ihe mere ọtụtụ ndị Naijiria ji arịa ọrịa kansa ugbua bụ na ha anaghị erizi nrị ala anyị dịka garị, ji nke nwere faiba ka ma ha na-eri nri ndị bekee. Agwa bụ nri ọzọ e jiri mara ndị ogbenye mana ọtụtụ ọgaranya na-erizi ya. Agwa na-enye proten ma na-enyekwa ọbara. Ndị ọkachamara n'ihe gbasara nri na ihe ha na-enye na-ekwu na agwa kacha mma maka nweta protein karịa anụ ehị n'ihi na onweghị abụba ọjọọ nke a kpọrọ Kọlesịterọl. Ụkwa bụ nrị ndị ọgrlanya na-eleghara anya na mbụ, ikekwa n'ihi ahụhụ dị na-ikwado ya, mana ugbua, ọ bụzị onye ji ego na-eri ụkwa. Ụkwa na-enye proten, ọbara, potassium nakwa ngwa ndị ọzọ na-edozi ahụ. Ji mmiri bụ nri ndị mmadụ anaghị erikarị na mbụ n'ihi na ọ naghị atọ ka ji. Sọọsọ ndị ogbenye jibu ya achụ agụụ. Mana ugbua, ọtụtụ ndị mmadụ gunyere ndị ọgaranya na-eri ya. Ndị na arịa ọrịa shuga na-erikwa ya. Ndị nchọpụta na-akọwa na ji mmiri nwere fibre rie nne, obere ""sodium"" na nnukwu ""potassium"" nke mere e ji kwuo na ọ na-adị ndị na-arịa ọrịa shuga mma n'ahụ. Cheta na ""fibre"" na-enyere nrị aka igwepịa n'afọ (digestion), oke ""sodium"" so ebute ọbara mgbalienu, ebe ""potassium"" na-akụjulata ọbara, chụmie mmadụ inwe ọrịa okwute akụrụ (kidney stone). Ndị enweghi ego na-ejibu isha esi nri oge ha e nweghị ego anụ maọbụ azụ, ma ugbua, isha bụzikwa maka ndị nwere ego n'ihi oke ida ọnụ ahịa. Dika ọkammụta na ihe gbasara nri na ihe ọ na-arụ n'ahụ bụ Dr Florence Uchendu si kọwa ihe mere na ọtụtụ ndị mmadụ na-eri nri a na-agbara ọsọ ugbua karia bụ maka na ọrịa dị na Naijiria ugbua dịka ọrịa shuga, ọbara mgbalienu, ọtụrụọkara(stroke), kansa. ""Ọrịa dịzị na Najiria bụ ọrịa dị n'obodo oyibo anyị anaghị arịabu mbụ. Ihe dika ọbara mgbalienu, ọrịa shuga juziri kịta."" ""Ndị mmadụ amatago ihe ị ga-eri onyewe gị nsogbu n'ahụ ma nwekwa ike nyewe gị nsogbu n'ahụ.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-43484402 +religion Good Friday: Ihe Easter ji apụrụ m iche karịa emume ụka ndị ọzọ' "Emume Easter nke gụnyere Holy Thursday na Good Friday bụ emume pụrụ iche n'etiti ndị otụ Kraisti dịka ọ bụ mmemme eji echeta ọnwụ Jisọs Kraistị na mbilite n'ọnwụ ya. Mana etu ihu ndị mmadụ sị dị iche, ka etu ihe Easter pụtara ha dị. 'Easter pụrụ m iche n'ihi na Ada m mụụ ejima' Amaka Umeh, onye bụ onyenkuzi kwuru na ezịnaụlọ ndị di ya na-akpọ emume 'Easter mkpa karịa Ekeresimesi. ""Ọ bụ mgbe ndị ezịnaụlọ ndị be di m na-eme mgbakọta dịka ezinaụlọ; ha na-esi ebe niile ha bi lọta, mee ekpere, merụba ụbọchị."" ""Ọ na-adịrị anyị ka Ekeresịmesi."" Umeh ka ndị ka nwa agbọ aga ekenye dị ọhụụ na enwe ọnụ na ada ya nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ n'izu a. O kwuru na, ""Easter afọ pụrụ ya iche n'ihi na ""abụrụla mmama nnukwu. Nwa m nwaanyị ritere ejima ụbọchị 'Holy Wednesday"". 'Emume ụka abalị Easter na-awụm akpataoyi' ""Amaechi Theo-Vincent ejighị emume Easter achị. Na nkọwa ya,ọ bụ oge mbilite ọnwụ Jisọs Kraist n'ihi na ""ọ bụrụ na o biliteghị n'ọnwụ nkwenye m na Kraistị kara abụ ihe efu."" Ihe Easter jikara pụrụ Theo Vincent iche bụ otu egwu ndị ụka Katọlik na-agụ n'abalị Easter. "" O biliwo ee h O biliwo Jesọ akpọgidere n'obe oh ,Onye mmeri."" ""A na-agụ egwu ahụ, na-akụ ịgba, akpataoyi a na-awụ m. ọ dị m ka a hụụ m Jeso ka ọ na-ebilite. Ya mere na ọ na-amasị ịga ụka abalị Easter."" "" Ọ bụrụ n'obodo, a na-agba egbe mkpọnala ma elekere iri na abụọ nke ime abalị.""Ọ na-awụ m akpataoyi, ụfọdụ anyammiri ọnụ na-apụta n'anya n'ihi ihe Jisọs mere m."" 'Emume ụka Easter na-atọ m iche' Blessing Nwobodo-Itua kwuru n'ihe na-atọkarị ya n'Easter bụ emume 'Easter'. ""Oge Easter kachasị tọọ m bụ oge m nọ na mahadụm 'Madona University' n'ihi etu emume Easter si aga ebe ahụ dịka ogbe jikọrọ ọnụ. ""Ma ndị sista, ma ndị fada na ụmụakwụkwọ na-agbakọta ọnụ maka emume ahụ bido n'ụbọchị Good Friday, Holy Saturday nakwa ụka Easter n'onwe ya."" ""Mana ugbua n'ihi ọrụ na mkpa dị ọzọ ọ na-ewute m na anaghị esonye n'emume Easter n'ihi na Easter dị mkpa Karia Ekeresimesi."" "" Ọ bụrụ na e nweghị Easter, angaghị enwe okpukpere ụka Kraistị.""" https://www.bbc.com/igbo/47987055 +business CBN Redesign Naira: Enweghị uru ibipụta ego ọhụrụ ga-abara Naijirịa ugbua - Ndị ọkammụta "Dịka gọọmentị na-akwado ibipụta ego ọhụrụ, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu ihe dị iche iche maka ya bụ atụmatụ. Ndị ọkaibe n'ihe gbasara akụnụba obodo bụ Katch Ononuju na Bongo Adi gwara BBC Igbo uche ha maka ya bụ okwu ibipụta ego ọhụrụ. Bongo Adi kwuru ka gọọmentị Naijirịa wepụ aka enwe n'ofe. Bongo kwuru sị, ""Ha na-ala obodo a n'ihi, obodo ndị ọzọ akụnụba ha ka nke Naijirịa mma na-akpakọ onwe ha, kama anyị na-achọ ụzọ mmefu"". Bongo jụrụ sị, "" Ọ bụ ego ọhụrụ bụ mkpa Naijirịa. Ndị na-ekwu na ebipụta ego ọhụrụ na ndị zokpuru ego ha ga-ewepụta ya. Ọ pụtara na gọọmentị enweghị ebe edenyere ego ole nọ na Naijirịa"". O kwuru na ibipụta ego ọhụrụ ọzọ ga-efu kwa Naijirịa ego. Bongo kọwara sị, "" Ndị na-edowe ego na edowe ya na Dọla maọbụ pawụnd, ya bụ atụmatụ agagfhị eme ka ndị dowere ego wepụta ya. N'aka nke ọzọ ka Katch Ononuju kwuru si na ibipụta ego ọhụrụ bụ usoro nrụrụaka. O kwuru sị,"" Ya bụ atụmatụ adịghị mma, Naịjirịa enweghị ego, anyị na-ebiri nke anyị na-emefu. Ugbua ọ bụ mgbe e kwesịrị imefu ego ịbipụta ego ọzọ"". Ononujo gara n'ihu kwuo,"" dịka m sị ahụ ya, anyị ga-ebiri ego ọzọ maka atụmatụ a nke ga-etinye kwu n'ụgwọ Naijirịa ji. Enweghị uru m hụrụ ọ baara akụnụba Naijirịa"". O kwukwara na ekwesịghị ihiwe iwu na mmadụ niile ga-eweghachi ego ha n'ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Jenuwarị afọ 2023. Ọ kwuru sị, ""Ọ bụrụ na mba ndị mepere emepe, a ga-eji nwayọ nwayọ mee ya kama etu ha sịrị mee ya ga-ebute egwu, ọ dịghị mma"". Ụlọakụ etiti nke Naịjirịa ekwuola na ha ga-ebipụta akwụkwọ ego naịra ọhụrụ iji gbanwee ndị nke ochie, malite n'ụbọchị 15 nke ọnwa Disemba 2022. Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele kwuru nke a oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Wenezde. Akwụkwọ ego ndị a ga-agbanwe bụ narị naịra abụọ, narị naịra ise na otu puku naịra. BBC Igbo kpọtụụrụ otu onye ọrụ n'ụlọakụ etiti ka ọ kọwaara anyị etu mgbanwe akwụkwọ naịra ndị a nwereike isi metụta ndị nkịtị na Naịjirịa. Lee ihe ọ kọwara: Chetakwa na akwụkwọ ego N200, N500, na N1000 nke ochie agaghịzi enwe isi ma ụbọchị 31 nke ọnwa Jenụwarị 2023 gachaa. Onye ọrụ CBN a na-achọghị ka anyị kpọpụta aha ya kwuru na ịgbanwe akwụkwọ ego nwereike iwe gọọmentị nnukwu ego ugbua, mana n'ọdịnihu, ọ ga-aba nnukwu uru karịa. Otu ọkpụrụkpụ ihe mere gọọmentị ji chọọ ịgbanwe akwụkwọ ego N200, N500 na N1000, bụ maka na ego dị n'aka ndị mmadụ ugbua karịrị ego dị n'ụlkọakụ dị icheiche ugboro atọ. ""Ọnụọgụgụ gosiri na ihe karịrị pasentị 85 ego niile na-agagharị na Naịjirịa ugbua dị n'aka ndị mmadụ,"" Emefiele kwuru. ""Iji kwuo ya nke ọma, na ngw��cha ọnwa Septamba, ụlọakụ etiti chọpụtara na n'ime tarị naịra atọ na ụma (N3.23 trillion) na-agagharị na Naịjiria ugbua, ihe karịrị tarị naịra abụọ (N2.73 trillion) dị n'aka ndị mmadụ nkịtị kama ịdị n'ụlọakụ dịka o si kwesị."" ""N'ọnwa Disemba 2015, ego na-agagharị na Naịjirịa dị otu tarị naịra na ụma (N1.46 trillion), mana ugbua, o ruola tarị naịra abụọ na ụma (N2,23 trillion)."" ""Nke a bụ ihe kwesịrị iche onye ọbụla uche, anyị agaghị ekwe ka ọ dịrị etu a gawa,"" Emefiele kwuru. Ihe ndị ọzọ: Emefiela kwuru na dịka usoro mmepụta ego na mba ụwa niile si dị, mba ọbụla kwesịrị ị na-agbanwe ego ha kwa afọ asatọ ọbụla, ""mana Naịjirịa agbanwebeghị akwụkwọ ego ya n'ime afọ iri abụọ gara aga"", Emefiele kwuru." https://www.bbc.com/igbo/articles/c1ev7kn43ygo +health Eji m N5,000 azụta ikuku 'oxygen' kwa ụbọchị - nwaanyị na-enweghi ike iku ume "Ị gwa mmadụ na o nwere onye dị ndụ na-azụta ume ọ na-eku, ụfọdụ agaghị ekwe. Mana ọ bụ ihe otu nwaanyị achọghị ka a kpọọ ya aha a ma dịka ""Nwachukwu"" na-agabiga. Mgbe BBC gara gbaa ya ajụjụ ọnụ gbasara ọnọdụ ya, o ji anya mmiri na obi mgbawa kwuo sị ""Chineke nyere m aka gabiga ọnwụnwa a"" I lee ya anya n'ahụ ị ga-ahụ na akpụkpa ahụ ya na-eji oji mana ihu ya na-acha ọcha, ị ga-anụkwa mkpọtụ igwe nkutu ụme nke o ji eku ume. Ọ bụ mgbe ọrịa rịara m ka ndị dọkịta gwara m zụta nke ya bụ igwe nkutu ụme maọbụrụ na m chọọ ịdị ndụ. Ọ zụrụ nke mbụ N650,000 mana a na-edozi ya ugbua. Ọ zụrụ nke abụọ bụ N350,000. Ọ zụkwara nke ejighi ọkụ latrịk arụ ọrụ bụ N65,000 ma jiri kwa N15,000 zụta 'oxygen'. Ọ zụkwara nke a na-akwọ n'azụ ka nwa ọhụrụ bụ N200,000 maka mgbe ọ ga-eji chọọ ịpụ apụ. ""E nwere m dọkịta anọ na-agwọ m ọrịa a, a na m emefu N70,000 kwa ọnwa. ""Aha ọrịa m na-arịa bụ Pulmonary hypertension, nke na-eme ka ọbara ghara ịrụ mkpụrụ obi ka o si kwesi"" ka Nigerian Goddess kọwara. Ọrịa ahụ malitere ị rịa ya mgbe ọ dị naanị afọ atọ ""akpụkpa ahụ m bu ụzọ gbajie oji tupu e mee nyocha chọpụta aha ọrịa ọ bụ"" ka o kwukwara. ""Ụfọdụ ndị dọkịnta gwara m na enwere m ike ịgbake n'ọrịa a mana ụfọdụ gwakwara m na m ga-aṅugide ọgwụ rue ọnwụ m."" Nwaanyị a kọwara na di ya chụrụ ya na ụmụ ise ya maka ọrịa a. O kwukwara na ọ dịghịrị ya mfe ị kwụrụ ha ụgwọ akwụkwọ, nye ha nri nakwa kwụọ ụgwọ ụlọ n'ihi ọrịa. ""Onye nwe ụlọ ezitela ozi sị m kwụọ ya ụgwọ ụlọ nke afọ mana amaghị m ebe m ga-esi nweta ego ahụ."" Gụnyere n'ịzụta ume ọ na-ekwu kwa ụbọchị, ọ na-aṅụkwa ọgwụ ruru mkpụrụ ise kwa ụbọchị nke ụfọdụ n'ime ya ruru N4,000." https://www.bbc.com/igbo/afirika-54307626 +sports AFCON: Flying Eagles enweela nnukwu mmeri Flying Eagles ga-asọmpị na AFCON N'egwuregwu, otu Flying Eagles emeriela Mauritania ọkpụ ise na-asataghi ihe n'ime asọmpi ga-ahọpụta ndị ga-agba n'asọmpị iko mpaghara Afirika n'afọ 2019. Nkea pụtara na ha ga-eso n'ime ala dị iche iche ga-asọmpị AFCON n'afọ na-abịa. Ọ bụ n'ala Niger ka asọmpị a ga-ebido n'ime ọnwa Febuwarị. Miyetti Allah kwesiri ịza ajụjụ - Gowon Onyechiburu Naịjirịa dịka onyeisiala n'oge garaaga bụ Yakubu Gowon ekwuola na obi gbariri ya agbari maka ọtụtụ mmadụ nwụrụ n'aka ndị na-achị ehi buru egbe na steeti di iche iche n'afọ a. N'ime ogbakọ Gowon na gọvanọ Benue steeti bụ Samuel Ortom mere, o kwuru na oge eruola ndị ọrụ nche dị iche iche n'ala Naịjirịa gbara onyeisi ndị otu Miyetti Allah ajụjụ ọnụ ga-akọwa ihe mere udi ihea na-eme n'ala a. O'diakpo Obire apụọla na APC Akụkọ pụtara na Delta steeti ugbua na-ekwu na O'diakpo Obire bụbụ onye na-azọ ọkwa ọchịchị dịka gọvanọ Delta steeti n'okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC ahapuọla patị APC gawa otu Progressive Peoples Alliance. Obire kọwara na ọ hapụrụ APC Delta steeti maka ọtụtụ nsọgbu na-emebi ihe n'ime patị a na steeti ahụ. Okpomọkụ na-egbu nmadụ na Japan Gọọmentị ala Japan na-adọ ndị ala ha aka na ntị ka ha zọ ishi ha maka nnukwu okpomọkụ na-egbu mmadụ ugbua n'ala ahụ. Akukọ pụtara n'ala ahụ ugbua na-ekwu na mmadụ ruru iri atọ anwụọla maka okpomọkụ a. Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a Lee ihe nkiri anyị https://www.bbc.com/igbo/44915051 +business Etu 'social media' si mee ka ahịa abacha nne m bụrụzie nke gara mahadum - Amarachi Igbo Otu ọkpụrụkpụ ihe nne na nna ji eziga ụmụ ha mahadum bụ ka ọdịnihu ha wee dị mma. Olileanya bụ na nwata gụchaa akwụkwọ dị elu pụta, ọ ga-achọta ọrụ wee malite inyere onwe ya na ndị ezinụlọ ya aka. Amarachi Igbo bụ nwaada gụchara akwụkwọ mahadum, ma fee ala Naịjirịa n'afọ 2021. Mana kama ọ ga-anọ nkịtị chọwa ọrụ oyibo, o sonyeere nne ya n'ahịa abacha ọ na-azụ. Iji gosi na ya agaala mahadum lọta, Amarachi malitere iji soshal midia ewulite ahịa abacha nne ya. Ugbua, ọtụtụ ndị ntorobịa na-akpọzị ya 'abacha gara mahadum'. Lee etu Amarachi si eme ya. Ndị mere akụkọ a bụ Chiagozie Nwonwu na Vining Ogu. https://www.bbc.com/igbo/58874585 +business Ọgba mbọ: Etu m si hibe ụlọọrụ si Naijiria ebuga ngwa nri na mba ofesi "Naijiria bụ obodo e ji itụbata ihe mara, nke bekee na-akpọ 'import-dependent' nation. Mana nwa ada Igbo a aha ya bụ Princess Vivian Agboanike na-esi na Naijiria na-ebupụ ihe oriri dị icheiche gaa mba ofesi. Princess kọọrọ BBC Igbo na ọ malitere ọrụ a oge ọ gụchara akwụkwọ sekọndịrị, wee na-achọ ihe ọ ga na-eme tupu ọ banye mahadum. ""Amalitere m ịga n'ụlọ n'ụlọ na-ajụ ndị mmadụ ma enwere ozi m ga-agara ha,"" Princess kwuru. ""Otu a ka m si bido igotere ndị mmadụ ngwa nri dị icheiche n'ụlọ ha."" Oge ọ gụchara mahadum, Princess chọpụtara na ọtụtụ ụmụ Naijiria bi mba ofesi na-achọ onye ga na-ezitere ha ihe oriri si Naijiria. Nke a mere o ji gaa ọzụzụ maka ibupụ ngwa nri n'obodo ọzọ, biakwa denye aha ya n'otu a kpọrọ 'Nigeria Export Organisation'. Ugbua, Princess nwere obere ụlọọrụ na-ebupụ ngwa nri dị icheiche gaa ọtụtụ mba ụwa ebe ụmụ Naijiria bicha. Princess kwuru na mgbe ọ malitere ọrụ, ụmụnne ya anabataghi ya, mana ugbua, onye ọbụla etinyela aka na ya. ""Naanị nne m nyere m nnukwu nkwado oge m na-amalite, mana ọ bụ ihe mwute na ọ laala mmụọ ugbua,"" ka o kwuru. ""Ndị ọrụ m ugbua akariala iri isii, tinyekwara ọtụtụ ndị ọzọ na-agara m ahịa izụtara m ngwa nri."" Ihe ndị ha na-esi Naijiria ebuga mba ofesi gụnyere: akwụkwọ nri dị icheiche, ose ọkpọọ na nke ndụ, mkpụrụ osisi dika mkpụrụ kashuu, ahụekere, jinja, egwusi, ọgbọnọ, azụ ọkpọọ, ji na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Princess kwuru na otu ihe nhịahụ dị n'ọrụ ha bụ na gọọmenti Naijiria anaghị enyere ha aka nke ọma. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chukwunaeme Obiejesi." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60845283 +entertainment August Meeting: Ị ma etu nzụkọ ụmụnwaanyị a pụrụiche si bido? "Kwa ọnwa Ọgọst afọ ọbụla ụmụ nwaanyị Igbo bi n'ebe dị icheiche na-alaghachite n'ala Igbo izuko. Nzụkọ ahụ na-akpọlata ha bụ nke e ji ""August Meeting"" mara. Ọ bụ ebe ha na-akpa ma na-ahazi ọdịmma obodo, ikpezi esemokwu nakwa iwulite ndị ntorobia nakwa ụmụ nwaanyị ibe ha. O nwekwara ihe ndị pụrụiche eji a ma nzụkọ ahụ. Ha gụnyere: Etu Nzukọ a si malite Nzụkọ Ọgọst a gbadoro ụkwụ na nzụkọ ebidoro na mba Briten n'afọ 1876 nke mechara bụrụ 'Mother's Union'. Lady Joy Nwankwo bụ onyeisi ndị nzukọ ụmụnwaanyị nke ụlọụka dị na Ndiowu dị n'okpuruọchịchị Orumba North nke Anambra steeti kọwaara anyị maka nke a. Ọ sị ""nzukọ ụmụnwaanyị nke ụlọụka malitere n'afọ 1876, dịka Mary Summer bụ nwunye otu ụkọchukwu kpokọbara ụmụnwaanyị ibe ya ma kuziwere ha ihe"" ""Nke ahụ bụ maka iwulite ezinaụlọ nakwa ịzụ ụmụaka nke ọma mana ugbua, ọ ghọrọla ụzọ e ji ekpezi esemokwu nakwa ịnyere ụlọụka aka"" Ebe ahụ ka ụlọụka ndị Anglịkan si kpọkọzie nzụkọ ụmụnwaanyị ahụ ma kuziwere ha ilekọta obodo ha na, ịlekọta ezinaụlọ ha ọ kachasị ụmụ agbọghọ. Lady Nwankwo kọwakwara na ha na-enye enyemaka ego nakwa enyemaka idozi ụfọdụ ihe n'ime obodo. ""Ọ bụ nzụkọ ụlọụka bu ụzọ tinye nzụkọ n'ọnwa Ọgọst n'ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka ụmụaka na-enwe oge ezumike nke mere ya mfe ka ndị nne mara ebe a ga-akpọsa ha"" ""Ndị obodo mechara tinyezie nke ha n'ọnwa Ọgọst ahụ kwa maka etu o si daba ọfụma"" ka ọ kọwakwara. N'obodo ya bụ Ndiowu nzụkọ ụmụ nwaanyị ahụ arụọla mposi, rue ụlọ ebe ụkọchukwu bi ma nye ụlọụka onyinye otu nde naira iji gboo mkpa dịrị ha. Mmepe batarala n'ala Igbo maka nzụkọ a Ị jụọ ase n'obodo dị icheiche, ị ga-ahụrịrị opekatampe otu ihe gbara ọkpụrụkpụ nzụkọ ụmụnwaanyị a wetara. Dịka ihe ndị ha na-etinye anya na ya metụkarịrị ụmụ aka nakwa ụmụ agbọghọ, ha na-emepụtakwa ihe n'obodo. Dika Lady Nwankwo si kwuo, n'Ekwulobia bụ obodo dị n'okpuruọchịchị Aguata n'Anambra, nzụkọ ụmụnwaanyị rụgharịrị ụlọọgwụ obodo ahụ na-adakpọ adakpọ. Ha rụgharịkwara ọgba aja gbara ụlọọgwụ ahụ okirikiri ma tinyeso ndị dọkịnta ga na-elekọta ndị mmadụ anya. Onye ọzọ bụ Amuche Nnabueze so n'otu nzụkọ ụmụnwaanyị n'Ukehe dị n'Enugwu steeti kọwara na nzụkọ mere ihe ndị a: -A lụrụ ọgụ ịkwụsị ọgwụike, mmanya ọkụ n'obodo ha n'afọ 2015. -Ha machiri ndị mmadụ ịkwa akwa n'akwamozu mmadụ karịa ndị onye ahụ mụrụ n'afọ. Kama ha na-akwa akwa mgbe onye ahụ dị ndụ nke pụtara ịkwa onye ahụ ebe ọ dị ndụ -Ha azụọla ihe ruru mmadụ iri na Mahadum ma na-azụkwa ihe karịrị mmadụ ise n'efu na Mahadum nakwa ụlọakwụkwọ sekọndrị. -Ikuziri ndị nne na nna ilekọta mbara ebe ha bi n'afọ 2021." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58301069 +entertainment Akunna Chimezie Miracle: Nne m ji ire 'bread' zụọ mụ na ụmụnne m na mahadum. Ọtụtụ ekwuola na o nweghị ịhụnanya dị n'ụwa karịrị ịhụnanya nne hụrụ nwa ya. Akụkọ Akunna Chimezie Miracle na nne ya bụ Rose Akunna egosila na nke a bụ eziokwu. Rose Akunna mụrụ ụmụ anọ, Miracle bụ onye nke mbụ, mana nna ha anwụọla nke mere ka nne ha malite ire achịcha na agwa. Ọ bụ ihe a ọ na-ere ka o ji zụọ Miracle na ụmụnne ya malite na Praịmarị garuo Mahadum. Miracle wuru ewu na soshal midia oge o gosiri foto ya na nne ya ma kwuo na ọ bụ ire 'bread' ka nne ya jiri zụọ ya na ụmụnne ya na Mahadum. Gere etu ha siri kọọrọ BBC Igbo ya bụ akụkọ. Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi, Nnamdi Agbanelo na Vining Ogu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-57802751 +sports José Peseiro Profile: Ihe ị kwesịrị ịma maka onye nkuzi ọhụrụ Super Eagles "N'abalị 29 nke ọnwa Disemba 2021, ka ụlọọrụ Nigeria Football Federation (NFF) kpọpụtara José Peseiro dịka onye nkuzi ọhụrụ otu Super Eagles nke Naịjiria. NFF bụ otu na-ahụ maka nlekọta na nhazị egwu bọọlụ na Naịjirịa. Ozi a ha zipụtara na-abịa ka ọ fọrọ naanị otu izu na ụma tupu asọmpi Iko mba Afrịka (Afcon) amalite na mba Kamerun. Okwu onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua a bụ ""Onye bụ José Peseiro a bụ onye na-anọchi Gernot Rohr kuziri Super Eagles afọ ise (2016 - 2021)?"" Mara na NFF kwuru n'ezie na ha kpọkuru Mourinho nakwa Arsene Wenger chịkọburu Arsenal, ka o nye ha ntuziaka tupu ha e mechaa wee Peseiro n'ọrụ. Peseiro na-anọchi Rohr kpọruru Naịjiria asọmpi Iko mbaụwa 2018 nakwa agba ngwụcha nke atọ n'asọmpi Iko mba Afrịka nke afọ 2019. Gịnị mere NFF ji wepụ Gernot Rohr dịka onye nkuzi Super Eagles? Otu na-ahazị egwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF n'ịchafụ ekwughi kpọm kwem ihe mere ha ji kpebie ịwepụ Gernot Rohr dịka onye nkuzi otu bọọlụ Super Eagles. Ozi ha zipụtara dere: ""Anyị jị teknuzu mee ọgbakọ n'Sọnde, mkpebi anyị bụ iwepụ Gernot Rohr ma tinye Augustine Eguavoen ka ọ nọchite ya nwa mgbe nta..."" Dịka etinyere Augustine Eguavoen ka ọ nọchite anya Rohr ma kpọrọ otu Super Eagles gaa asọmpị Afcon 2021, lee ihe ndị mmadụ na-eche mere e ji wepụ Gernot Rohr. Ọtụtụ ndị mmadụ na-eche na ihe mere e ji wepụ Rohr bụ maka etu ọtụtụ ndị nkwado egwu bọọlụ Naịjirịa si tie mkpu nye NFF ka ewepụ nwaamadị a n'oge gara aga. , Ọkachasị mgbe emenyere otu bọọlụ Super Eagles ihere oge ha nọ na-akwado maka iko mbaụwa nke 2022. Ka ndị mmadụ si depụta na soshal midia ha nakwa ebe ndị ọzọ, ihe kacha wee ha iwe bụ na ọ bụ mba Central African Republic menyere ha ihere na Naịjirịa dịka agbara ya bụ asọmpị n'ama egwuregwu, Teslim Balogun Stadium dị na Legọs. Ndị nwere agba na Naịjirịa so tie mkpu ka ewepụ Rohr gụnyere aka chịbụrụ Abia steeti bụ Orji Uzor Kalu, ozi ya kwuru: ""Kamgbe afọ ise Gernot Rohr nọ n'oche dịka onye nkuzi Super Eagles, otu bọọlụ a achitabeghi aja ọbụla... Kedụ ihe mere awepụbeghi ya n'ọkwa oche a?"" Dịka Naịjirịa zutere mba Cape Verde n'asọmpị ọzọ, ha gbanyere onwe ha otu goolu, otu goolu, nke mere mkpu ndị mmadụ ji mụbawanye dịka mba Cape Verde ekwesighi ịtụnyere Super Eagles ka ndị mmadụ si kwuo. Ndị ọzọ tiri mkpu akwa ka ewepụ nwoke a bụkwa ndị bụbu ndị isi otu ""Sports Writers Association of Nigeria (SWAN)"" nke bụ otu ndị na-ede akwụkwọ nakwa na-agbasa ozi banyere egwuregwu. Ha gwara otu NFF ka ewepụ Gernot ma tinye onye ọzọ aka siri ike ka ọnọchịte ya. Marakwa na Rohr bụ onye nkuzi otu a kacha nọtee aka n'ọkwa ọchịchị dịka o kusiri otu Super Eagles ruo afọ ise. NFF ahazịrịala ọkwa onye nkuzi otu Super Eagles kwa mgbe kwa mgbe. Lee ndị nọrọla n'ọkwa oche a bido n'afọ 1999 ruo ugbua: ** Augustine Eguavoen (Onye nnọchịte anya Gernot Rohr ruo nwa mgbe nta) Marakwa n'otu bọọlụ Naịjirịa bụ Super Eagle amaliteghi n'afọ 1999, kama mba Briten hibere otu a mgbe ha na-achị Naijịrịa n'afọ 1949. Super Eagles gbara asọmpị Afcon nke mbụ ha n'afọ 1996 dịka Naijiria nwetechara nwereonwe n'afọ 1960." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-59816012 +religion Anambra Church Invasion: A mabeghi ndị wakporo ụlọụka n'Aguleri - Uweojii "Uweojii Anambra Steeti ekwuola na ọ bụ ndị ha na-eche na ha bụ ndị ohi gara n'ụlọụka Anglican dị n'Aguleri merụọ ụkọchukwu na ndị ọzọ ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Mohammed mere ka BBC Igbo mata nke a. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị nwakpo ndị obodo ọzọ mere dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia. Kama na nyocha ka na-aga n'ihu ịmata ndị mere arụ a ma chọpụta ihe bụ ebumnobi ha na mwakpo ahụ. Ọ sị; ""Onweghi onye ga-asị na ọ bụ mwakpo ndị obodo ọzọ mere kama nyocha ka na-aga n'ihu ịmata nke bụ eziokwu."" Mana onyeisi obodo bụ Hipo Onwuegbuke gwara ndi ntaakụkọ na mwakpo a akarịala naanị izu ohi. O kwuru na ụdịrị ya emeela na nso nso bụ nke ndị nchekwa obodo gbochiri. Akụkọ pụtara na ngwụcha izuụka na ndị omekaome wakporo ụlọụka St Peters Anglican dị n'Agụleri Anambra Steeti n'ụbọchị 2 ọnwa Julaị. Na mwakpo a, ha merụrụ onye nkuzi ụlọụka bụ Christopher Chukwu, onye ụkọchụkwụ bụ Akachukwu Ikedilo na ọnye ọzọ bụ Mathew Nwude ahụ. Ndị omekaome riri mbọmbọ ọsọ tupu ndị uweojii na ndị nchekwa obodo erute ebe ahụ. Dịka ọ dị ugbua, ndị merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-48912737 +business Ojoto, Obodo e ji ịrụ ụzọ ama odogwu """Irụ ụzọ bụ ihe anyị ji ama aka n'Ojoto. Ọ bụrụ na ị rụbeghị ụzọ, ị mara na i sobeghị n'ihe a na-eme"". Nke a bụ ọnụokwu onye ntorobia bụ Anayo Chukwujama bụ onye kọwara BBC Igbo ka ịrụ ụzọ si dị ndị Ojoto, okpuruọchịchị Idemili Saụt, Anambra steeti, oke mkpa. Onyeisi ọgbakọ ndị Ojoto bụ Chukwudi Maduabuchi kwuru na isi sekpụ ntị na ịrụ ọrụ obodo ọbụla bụ ntụkwasị obi ndị mmadụ nwere na ndị ọchịchị ha. Ọ sị na, ""mgbe anyị hụrụ otu ụzọ anyị dị, ụmụnne anyị sị ka ha malite iru ya maka na anyị agaghị ahapụrụ gọọmentị ihe niile"". Otu ahụ ka ha si malite ịrụ ụzọ niile, malite n'otu rụọ abụọ na atọ. Chukwudi sị na ebumnobi ha bụ ịrụcha ụzọ niile n'Ojoto, agbanyeghị na ọ dị oke ọnụ. O kwuru na ""ụmụnne anyị zuru ka e mee"". Ihe onye ọbụla ma bụ na ọ bụ gọọmentị na-arụ ụzọ maka oke ego so ya bụ ọrụ. Ọzọ bụkwa na ọtụtụ mgbe gọọmentị ụfọdụ anaghị achọ ka ndị mmadụ tinye aka n'ọrụ dị ọtụ ahụ. Mana Anambra steeti emegharịala ya bụ iwu edeghị ede nke mere na ha pụrụ iche na nke a. Odeakwụkwọ ukwu bụ 'Permanent Secretary' nke Ministry n'ahụ maka ọrụ na Steeti ahụ bụ Laz Okafor sị na ""ọ bụ n'ọchịchị Peter Obi ka a malitere ndị obodo ịrụ ụzọ ha"". Okafor sị na otutu obodo ndị ọzọ n'Anambra arụọla ọtụtụ ụzọ be ha. O kwuru na gọọmentị Peter Obi na-enyere ndị obodo nkwado site na-iruru ha kilomita ole ha ruru. ""ọ bụrụ na obodo ruo kilomita iri, gọọmentị ga-arụkwara ha iri"", ka Laz kwuru mgbe BBC Igbo kpọrọ ya n'ekwentị. Gbado anya kirie ihe onyonyo a n'uju ya." https://www.bbc.com/igbo/articles/cpr9e73g44lo +politics Chukwuemeka Ezeife: Mbụ ihe e jiri mara ndị Igbo bụ eziokwu Chukwuemeka Ezeife, aka chịburu Anambara steeti kwuru na mpụ mere na ntuliaka ọkwa gọvanọ Kogi na Bayelsa steeti enweghị atụ. O kwukwara na ihe kara ndị Igbo mma ugbua bụ nhazigharị na mpaghara nke Bekee kpọrọ 'restructuring'. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50550975 +politics Aga m etinye ndụ m maka Nwosu ịbụ gọvanọ - Okorocha Akụkọ kachasị mkpa taa: Gọvanọ Okorocha aṅụọla iyi Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha e forola ntụtụ taa na ọ ga-ekwerịrị ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu n'aka dịka gọvanọ ga-anọchi anya ya. OKorocha n'oge o duru Odeakwụkwọ gọọmenti Imo State bụ Mark Uchendu na dị ọzọ n'iyi ọrụ kwuru na ọ ga-etinye ndụ ya na ọbara ya iji hụ na o nyere Nwosu ọkwa ọchịchị. Ụlọomeiwu amalitela ọzọ taa ileba anya n'akwụkwọ nhazigharị ntuliaka bụ nke onyeisiala Muhammadu Buhari jụrụ ibinye aka. Onyeisioche kọmitii na-ahụ maka ntuliaka bụ Suleiman Nazif kwuru na nke a bụ maka ọ dị mma ndị Naịjirịa. Ụlọikpe mbaụwa na-ahụ maka mpụ a maala onye bụbu osote onyeisiala mba DR Congo bụ Jean-Pierre Bemba ikpe ma tụọ ya mkpọrọ otu afọ. Ụlọikpe a kwuru na o nyere ndị akaebe ngarị n'ikpe a na-ekpe maka mpụ ọ mere n'agha megide mmadụ. Otu jikọtara ndị ogbu bọọlụ na mba Ghana a machibidola ndị otu ha mmadụ isii ọzọ igbu bọọlụ ka e mechara nyocha iri ngarị. Otu ahụ machikwara ndị ọrụ asọmpi iri anọ na asaa rue ogologo afọ iri, ebe ha kagburu ebubo eboro ndị ọzọ. BBC Igbo mere njem na mpaghara ọwụwanyanwụ Naịjirịa inyocha ụfọdụ ụzọ ndị gọọmenti etiti kwuru na ha na-arụ ma hụ na onweghị ndị nọ ọrụ n' ụzọ si Owere gawa Port-Harcourt. Akụkọ anyị na-anụ ugbua bụ na aka chịburu Enugwu steeti bụ Chimaroke Nnamani, anarala akwụkwọ mmasị ịzọ ọchịchị. Ọ chọrọ ịzọ oche nnọchite Enugwu East n'ụlọomeiwu ukwu, n'okpuru otu PDP. Aka na-achị Kogi steeti bụ Yahaya Bello, akpọkuola gọomentị etiti ka ọ gbatara ndị steeti ya ọsọ enyemaka maka idemmiri na-enye ha nsogbu. O kwuru na idemmiri a metụtara ihe ruru obodo narị abụọ dị n'ime okpuru ọchịchị iri na steeti ahụ, karịrị nke ha hụrụ n'afọ 2012. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Idemmiri eriela ụfọdụ obodo na Kogi steeti Oke ifufe na idemmiri ka na-enye mba Amerịka nsogbu. Ebe ọ kwụ ugbua, Ifufe Florence a ataala isi ihe ruru mmadụ iri na asaa, ebe mmiri akwụsịbeghị izo n'ụfọdụ obodo dị na Nọt Karolaịna kamgbe ụbọchị anọ gara aga. Otu atọ apụọla n'asọmpi bọọlụ nke Iko Aiteo a na-agba na Naịjirịa. Ifeanyi Ubah FC buliri iko a n'afọ 2016, Niger Tornadoes buliri ya n'afọ 2017 na Go Round FC, bụ otu ndị a gbapụrụ n'agba mbụ nke asọmpi a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-45545496 +entertainment Davido: Unu ga-atakwute ya kọnkịrị n'ụlọmkpọrọ - Davido "Otiegwu Daivdo aṅụọla iyi na ụmụagbọghọ abụọ boro ya ebubo ịtụwa otu n'ime ha ime ga-ahuju anya. Ihe onyonyoo na-efegharị na soshal midia gosiri ụmụagbọghọ abụọ na-ekwu na ọ bụ Davido tụwara otu n'ime ha ime ma gọlahụ ya. Ha kpọrọ Davido iyi elu na ala ma kwuo na ha na ya ga-etinye ụkwụ n'otu trawụza ma ọ kachie ntị na-agọ agọ. Nke a wutere Davido, onye ezigbo aha ya bụ David Adeleke, nke ukwu. Ya mere o ji foro ntutu taa na ọ ga-agbarịrị ụmụagbọghọ ahụ akwụkwọ n'ụlọikpe. Davido kwuru na ụmụagbọghọ ahụ ga-akwụ ya ijeri naịra iri atọ tupu e si n'ụlọmkpọrọ tọhapụ ha. O kwuru na ọ ga-akwụ onye ọbụla ga-enyere ya aka ịchọta ha otu nde naịra. E mechaa, Davido kwuru na ya achọtala ha. Ugbua, ụmụagbọghọ ahụ ekwuola na ọ bụ egwuregwu ka ha na-egwu. Ha kwuru na ha ma ụma kwuo ihe ha kwuru iji kpaa ndị mmadụ ọchị. Mana Davido achọghị iji ntị anụ nke ahụ ma ncha. O depụtara n'akara 'instagram' ya na ya agaghị edi ihe ahụ ụmụagbọghọ ahụ mere. ""Ọ bụ ihe a ka ụnụ na-enye nwunye m ka mụrụ nwa ọhụrụ?"" Cheta na enyi nwaanyị Davido bụ Chioma mụtaara ya otu agadaga dimkpa na nsonso a. Onyeisiala Muhammadu Buharị na onyeisiala mba Russia bụ Vladmir Putin zutere ma najie aka taa dịka ọgbakọ Russia-Africa Summit biiri ọkụ. Buharị na ọtụtụ ndị isi gọọmentị mba Afrịka ndị ọzọ na-esonye n'ọgbakọ ahụ nke ga abịa n'sisi njedebe n'ụbọchị Fraịdee. Ihe anya mmiri mere taa n'okporoụzọ awara awara si Legọs gawa Ibadan. Ihe mberede okporoụzọ tara isi otu onye ma merụọ onye ọzọ ezigbo ahụ mgbe ụgbọala bu container kụpịara otụtụ ụgbọala na-agara onwe ha. Ndị ọrụ nchekwa ụzọ kwuru na o nwere ike ịbụ oke mmiri zoro n'ụtụtụ Wenezdee na Legọs kpatara nke a. A hụrụ ozu mmadụ 39 na UK Ndị uweojii nwụchiri ụgbọala gwongworo bu ozu mmadụ iri atọ na itoolu n'obodo Essex nke dị na mba UK n'ehihie taa. Aka akparala nwata nwaokorobịa nya ya bụ ụgbọala wee si mba Bulgaria wee bata UK n'ụbọchị Satọdee. Ndị uweojiikwuru na ọbụ ndị ọkenye iri atọ na asatọ na otu nwata ka a hụrụ ozu ha n'ime ụgbọala ahụ. Ha na-agbalịzi ugbua ịmata ndị e bu ozu ha n'ime ụgbọala ahụ. Dika goolu zoro ka mmiri na asọmpi Champions League ụnyaahụ, onye ma ihe ga-eme taa. Chelsea na Ajax na-akwata ya ugbua, Liverpool ga-ezute Genk, ebe Barcelona ga-ezute Slavia Praha. N'asọmpi ndị ọzọ, Inter Milan na Borussia Dortmund ga-akwata ya, Olimpique Lyonnais ga-ezute Benfica. Agbatiala ụbọchị nrụcha ọdọụgbọelụ n'Enugwu Ibe anyị o, a sịzịkwa na ọ bụ n'ọnwe Apreelụ 2020 ka a ga-arụcha ọdọụgbụelụ Akanu Ibiam dị n'Enugu. Minista nọ n'isi ụlọọrụ ahụ bụ Hadi Sirika sị na ya agaghị atụrụ ndị mmadụ asị na ya gaghaị arụcha ya bụ ọdọụgbọelụ na Disemba dịka ha kwuburu mana ya ga-eburu isi ụlọọrụ ya ga-gwunye n'Enugu ịhụ na ha rụchara n'Apreelụ. Minista kwuru nke a mgbe ọ na-akọwara ndị kọmitii na-ahụ maka njem ụgbọelụ maka ego ha mapụtara itinye n'ọrụ na-afọ 2020. O kwuru na maka ya bụ ọkpụrụkpụ ego onyeisiala Muhammadu Buhari tinyegoro aka na ya maka ya bụ ọrụ, na ndị ọrụ ngo ga-amalite ya bụ ọrụ mgbe adịghị anya. O kwuru na Onyeisisala enyela ikike ka ndị niile ya bụ ọrụ metutere malite ọrụ ha ozugbo. Sirika kwukwere na ya bụ ọdọụgbọelụ ga bụ okaibe mgbe a ga-arụcha ya. Ọgbaghara ịkpaoke agbụrụ na Saụt Afrịka Unu ahụlanụ o, emeruola mmadụ anọ ndị Naịjiria ahụ na ọgbaghara ịkpaoke agburu ọzọ na Saụt Afrika. Onyeisi ndị Nigerian Union South Africa bụ Adetola Olubajo kwuru na agbara ụlọahịa ndị mmadụ ọkụ na ya bụ ọgbaghara bidoro na Mpumalanga Province ụnyahụ. Nke a na-abịa ka onyeisiala Muhammadu Buharị na ọgbọ ya nke Saụt Afrika bụ Cyril Ramaphose nwechere mkparịta ụka na Saụt Afrịka maka ọdịmma mba abụọ ahụ. N'ofesi, onyeisi mba Briten bụ Boris Johonson ekwuola na ya ga-enwe ntuliaka ọhụrụ ma ọ bụrụ na Europian Union nyezuo ha ọnwa atọ. Chete na ụlọomewu mba ahụ jụrụ na ha agaghị akwado Johnson na nkwekọrịta ha na EU nwere n'izu uka gara aga." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50149659 +entertainment Johnny Depp Verdict: Ụlọikpe asịla Amber Heard kwụọ Johnny Depp $15m "Ụlọikpe ekpebiela ka Amber Heard kwụọ Johnny Depp bụbu di ya nde dọla 15 ebe Depp ga-akwụ Heard nde dọla abụọ, dịka o meriri ya n'ụlọikpe. Ụlọikpe kpebiri na Amber Heard dere akụkọ nkọtọ na mkparị (nke Bekee kpọọ libel) gbasara Depp ka ha gbasachara dịka di na nwunye. N'ihi nke a ha kwuru ka ọ kwụọ Depp nde dọla iri ($10m) n'ụgwọ iti aka n'obi maka ihe ndị o mebiri nakwa nde dọla ise ($5m) dịka ntaramahụhụ. Heard bụ ome ejije na Hollywood bu ụzọ kpụpụ Depp bụkwa ome ejije Hollywood n'ụlọikpe ebe o boro ya ebubo mmegbu oge ha bụ di na nwunye. Ndị otu ikpe (jury) chọpụtara na Heard kọtọrọ Depp n'ezie n'akụkọ o deere ndị ụlọntaakụkọ Washington Post n'afọ 2018, ebe o kwuru na ọ bụ; ""Onye a ma ama na-anọchite anya ndị a megbu emegbu n'ime ụlọ"", ma kpebie na ya bụ okwu Heard kwuru maka alụmdinanwunye ya bụ ""ụgha"", na e nweghi ihe akaebe ọbụla gosiri na o mere. ""Kwụọ Amber Heard nde dọla abụọ"" - Ọkaikpe Ụlọikpe kpebikwara ka Depp kwụọ Heard bụbu nwunye ya nde dọla abụọ maka ikwụtọ aha ya (nke Bekee kpọrọ defamation). Ha kwuru na o kwutọrọ ya site n'aka ọkaiwu ya bụ Adam Waldman, ma kwuo na ya bụ nde dọla abụọ bụ naanị ego iti aka n'obi. Amber kwuru na ""mkpebi a mechuru m ihu nke bụ na ọ tụrụ m ọnụ"" site n'ozi o zipụtara. Ọ bịara ụlọikpe mgbe otu ikpe (jury) merela mkpebi n'okwu a ebe Depp nọ n'ụlọikpe e mee mkpebi a. Ụlọikpe mechiri mkpesa n'okwu ikpe a n'izu gara aga dịka anya ụwa niile nọ na-ele ya bụ ikpe. Ụlọikpe ahụ nụrụ mkpes asaa dịka ọtụtụ ndị aka ebe pụtara kwuo ihe ha ma mere mgbe Amber na Depp nọkọ. Otu n'ime ndị aka ebe tinyere ọnụ bụ onye na-eyi akwa a ma ama bụ Kate Moss dịka ya na Depp yịburu n'ebe afọ 1990. Johnny Depp v Amber Heard: Kedụ ihe na-ese? John Depp gbara afọ 58 kpupụrụ Amber Heard ụlọikpe n'ọnụ ego dọla nde 50 maka akụkọ o dere banyere ya nke kwuru na Depp mekpara ya ahụ oge na nọ dịka di na nwunye. Heard kpụpukwa Depp ụlọikpe n'ọnụ ego nde dọla 100. E hibere otu ikpe mmadụ asaa kwesiri ịnụ mkpesa ha ma nwee nkwekọrịta n'okwu mpụtara ya bụ ikpe. N'ọnwa Disember 2018 Heard dere akụkọ banyere Depp nye ụlọọrụ ntaakụkọ The Washington Post nke isi okwu ya bụ ""Onye a ma ama na-anọchịte anya mwakpo na mmekpa ahụ"" O bokwara ya ọtụtụ ebubo maka mmekpa ahụ na mwakpo. Depp ghọrọ na aka ya adighị n'ebubo ndị a. Dịka Depp nwetere mmeri nke gosiri na aka ya dị ọcha, Heard ga-akwụ ya ụgwọ maka mmetọ aha ya. Makwụkwa ya ụgwọ maka ihe ndị ikpe a mebiri ya nke gụnyere ọrụ ya dịka onye na-eme ejije." https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-61667870 +politics Etu na ihe mere ndị omeiwu Imo Steetị ji chụọ onyeisi ha bụ Chiji Collins Ndị omeiwu Imo achụpụla Chiji Collins dịka onyeisi ha n'ụbọchị Fraịde. Arthur Egwim bụ omeiwu 'chief whip' na-anọchiteanya mpaghara Ideato North gwara BBC Igbo ihe mere ha ji napụ Collins oche n'otele. Ọ sị na ihe mere ha ji chutuo ya bụ maka na ọ na-eji aka ike achị ndị omeiwu ibe ya na o rikwara ego. Egwim gara n'ihu kwuo na Collins na-agba ọchịchị gọọmentị Imo Steetị mgba okpuru ma rie ego ọha. O kwuru na onye wepụtara atụmatụ ka a chutuo Collins bụ Nnodumele na-anọchịteanya okpuruọchịchị Osu-Ama. Egwim gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị omeiwu 23 n'ime 27, gụnyere APC na PDP tinyere aka chụpụ ya n'ọkwa. Ọ sị na ọ bụ eziokwu na Collins anọghị n'ụlọomeiwu mgbe a chuturu ya mana ha mere nke a n'usoro iwu dịka osote nọ ebe ahụ. Onye ha ji dochie anya ya bụ Paul Emeziem nke na-anọchiteanya okpuruọchịchị Onuimo ga-abụ. Mana ọnụ na-ekwuru Chiji Collins bụ Mike Ohaka sị na ọ bụghị eziokwu na a chụọla Collins. Ọ sị na ndị omeiwu anaghị enwe nzukọ taa na ọ bụ n'izuụka na-abịa ab���a. Ohaka gara n'ihu kwuo na okwu banyere nke a ka na-aga n'ihu n'ụlọomeiwu https://www.bbc.com/igbo/afirika-54935550 +sports Olypmics 2021: Lee ụmụ Igbo ga-anọchị anya Naịjirịa n'asọmpi Olympics 2020 "A bịa n'egwuregwu nke bekee kpọrọ 'sports' na Naịjirịa, ụmụ Igbo so na ndị e ji aga mba. Dịka egwuregwu Olympics nke afọ 2020 na-amalite, ọtụtụ ụmụ Igbo sokwa na ndị a na-atụ anya na ha ga-emechapụ Naịjirịa ihere n'ihu. Cheta na otu bọọlụ Naịjirịa, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, etozughị iso gaa asọmpi Olympics nke afọ a, Ha dị mmadụ iri isii na otu (61) ga-anọchi anya Naịjirịa n'asọmpi dị icheiche n'Olympics nke afọ a. Ka anyị tulee ụmụ Igbo nọ n'ime ha. Otu 'Basketball' Ụmụnwoke Ọ bụrụ na i kee ndị otu 'basketball' Naịjirịa ụzọ abụọ, otu ụzọ n'ime ha bụcha ndị Igbo. Lee ha: Otu 'Basketball' Ụmụnwaanyị Ụmụ Igbo zukwara ezu n'otu 'basketball' ụmụnwaanyị ndị Naịjirịa. Lee ha: Uche Eke - 'Artistic Gymnastic' Uche Eke bụ onye mbụ ga-anọchi anya Naịjirịa n'egwuregwu 'gymnastics' n'asọmpi Olympics. Ọ malitere ịkụ ụgba oge ọ dị naanị afọ anọ. Nna ya bụ nwa afọ Igbo, mana nne ya bụ onye New Orleans na mba Amerịka. Chukwuebuka Enekwechi - 'Shotput' Chukwuebuka Enekwechi bụ onye nke iri n'ogogo ndị na-atụ 'shotput' n'ụwa niile. Ọ bụ ya bụ ọkaibe na 'shot put' n'Afrịka niile ka ọ dị ugbua. O ritekwala ọtụtụ nturuugo na ya bụ egwuregwu. Ọ bụ onye Anambra steeti. Chidi Okezie - Ọsọ 400 'meters' Chidi Okezie eriterela Naịjirịa ọla nchara abụọ n'asọ mpi mba Afrịka a na-akpọ 'African Championships' Nna ya bụ Moses Okezie bụ onye Igbo mana nne ya bụ Carol Morris bụ onye Jamaica. Nke a bụ nke mbụ ọ na-aga egwuregwu olimpik. Rosemary Chukwuma - Ọsọ 100 'metres' Rosemary bụ nwa afọ Ebonyi steeti. O ritekwerela Naịjirịa ọtụtụ ọlaedo n'egwuregwu ọsọ n'ụwa nakwa n'Afrịka. Nwokocha Grace - Ọsọ 100 'metres' Nwokocha bụ nwanyị Naịjirịa nke abụọ tozuru isonye n'asọmpi 'Tokyo Olymics' nke afọ a. Ka ọ dị ugbua, nwa ada a so na ndị ụkwụ na-aghọ nkọ n'ọsọ n'ụwa niile. Chioma Chukwujindu ""CiCi"" Onyekwere - 'Discus' A mụrụ nwaada Onyekwere na Naịjirịa mana ọ gafere mba Amerịka n'afọ 2002. Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum 'University of Maryland' ma nweta ọzụzụ na ngalaba 'Mechanical Engineering' O ritekwala ọtụtụ ọlaedo na mba Afrịka n'asọmpi 'shot put'. Annette Echikunwoke - 'Hammer' Annette Echikunwoke bụ aha na-ada ụda na mahadum University of Cincinnati ebe ọ bụ ọkaibe n'egwuregwu 'shot put', 'hammer' na ndị ọzọ. A bịa na mmụta, o nwere nturu ugo na ngalabamgbakọ na mwepu (Mathematics) nakwa ire ahịa (Marketing). Nne na nna ya bụ ndị Naịjirịa kama a mụrụ ya n'Amerịka. Oluchi Elizabeth Anyanacho - Taekwondo Nwa ada Anyanacho ga-abụ nwaanyị nke abụọ ga-anọchi anya Naịjirịa n'egwuregwu Olimpiks. Onye nke mbụ bụ Princess Dudu n'afọ 2004, oge Anyanacho ka dị naanị afọ ise. Onye nkuzi Anyanacho bụkwa nwa afọ Igbo, Chika Chukwumerije, onye riteere Naịjirịa ọla nchara n'asọmpi Olympics nke afọ 2008. Anyanacho dị afọ 21 ugbua, mana ọ malitere egwuregwu Taekwondo afọ ise gara aga oge ọ dị afọ 16." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-57882511 +politics "Constitution review: ""Akwụkwọ iwu e ji achị Naịjirịa abụghị nke Naịjrịa"" - Mbazulike Amechi" BBC Igbo gbara ndị ọnụ n'eru n'okwu ajụjụ ọnụ gbasara ihe na-akpọtụ gbasara ịdegharị akwụkwọ iwu Naịjirịa. Gee ihe ha kwuru https://www.bbc.com/igbo/afirika-57095306 +sports Nigeria vs Tunisia: Super Eagles anacharala Tunisia ọlanchara "Naịjirịa abụrụla ndị ga-erite ọlanchara nke Africa Cup Of Nations (Afcon) nke afọ 2019 site n'otu goolu Odion Ighalo nyere. Nke a mere ya ugboro asatọ Naịjirịa na-erite ọlanchara n'asọmpi Afcon. Ighalo gbara aka ahịa dịka onye Tunishia nyere ya ""nri chinyere"". Goolu a banyere na nkeji atọ e ji malite ọkara nke mbụ, ka Moez Ben Cherifia mara ụkwa n'ihu poostu ha. Nke a emeela ka Ighalo bụrụ onye kacha nye goolu n'asọmpi a, nke bụ na ọ ga-enweta akpụkpọụkwụ ọlaedo ma ọ bụrụ na enweghi onye ọzọ nyekarịrị ya. O nyela goolu ise n'asọmpi Afcon 2019 a. Nke a bụ tinyere goolu asaa o nyere mgbe Naịjirịa ka na-agba asọmpi iji tozuo bịa asọmpi Afcon. E ji Victor Osimhen tichie Odion Ighalo dịka ọ zọghiere ụkwụ ma merụọ ahụ. Ka e bidoro ọkara nke abụọ, ndị Tunishia chị ọkụ bịa, na-agba Naịjirịa ihe a gbachatara. Mana Firas Chaouat riwara agba ka o rutere n'ihu poostu Naịjiria na nkeji 48. Ị kwadoro ndị Super Eagles nke Naịjirịa dịka ha zọrọ inweta ọlanchara n'asọmpi Afcon? Ụfọdụ ndị chị obi n'aka na-ele ka ha mara ma Naịjirịa ọ ga-eme ha obere obi aṅụrị ka ha a ga-eji iru uju laba ụra, mana Naịjirịa nyere ha ihe mere ha obi ọma. John Mikel Obi so na ndị mbụ gara nata ọlanchara nke ya, dịka ọ bụ ikpeazụ ọ ga-eso Naịjirịa gaa asọmpi. Lee ihe ndị mmadụ kwuru na Twitter ka Naịjirịa merichara: Ndị @CAF_Online bunyere ha ụkpa ekele. @NGSuperEagles kelere ndị Naịjirịa maka ikwado ha ka a na-agba asọmpi a. @Omojuwa kọwapụtara ugboro ole Naịjirịa riterela ọlanchara n'asọmpi a. @oluwashina kwuru ugboro ole Naịjirịa natara ọlanchara a. Lee etu e si gbaa egwuregwu a. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49021373 +health Coronavirus tips: Lee nkọwa puruiche maka ọrịa a Ndị mmadụ nwere ọtụtụ ajụjụ ha na-ajụ gbasara ọrịa. Bịa mata ọsịsa gbasara ajụjụ ndị gbagọjuru gị anya maka ọrịa Coronavirus. Ndị mepụtara akụkọ a bụ Chioma Nkemdilim na Vining Ogu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52241495 +entertainment Chioma Jazmine Okafor: Etu m si mata di m na Tik Tok, anyị agbaa akwụkwọ n'ime ọnwa abụọ - Ada Mr Ibu "Ọbịbịa soshal midia emeela ka ụwa niile dịzie ka otu obere obodo, maka na mkparịtaụka mmadụ na ibe ya adịwanyela mfe. Ọ dịzi mfe mmadụ ịnọ na Naịjirịa mete enyi onye mba ofesi ha abụọ esi otu ahụ bụrụ nnu na mmanụ. Otu a ka ihu ọma si kpọọ Chioma Jasmine Okafor, bụ ada John Okafor (Mr Ibu), onye e ji ejije Nollywood mara. N'ọnwa Disemba afọ 2021 ka Jasmine Okafor zutere otu nwaokorobịa aha ya bụ David Mounds n'ọgbakọ soshal midia a kpọrọ Tik Tok, o ruo n'ọnwa Febrụwarị afọ 2022, ha abụọ abụrụ di na nwunye. Ihe tụrụ ọtụtụ mmadụ n'anya banyere akụkọ a bụ na David Moundz bụ nwaafọ mba Amerịka, onye na-akpabeghị ụkwụ mbụ na mpaghara Afrịka. Jasmine na di ya bụ David agbaalarị akwụkwọ n'ụlọikpe, ma na-echezi ka ha gbaa nkwụ ma gbakwaa akwụkwọ nke ụlọụka. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Jasmine David Mound gwara BBC Igbo ihe mere o ji lụọ nwoke ọ hụrụ na Tik Tok n'ime ọnwa abụọ. ""Ọtụtụ na-ekwu na ọnwa abụọ ezughị iji mata mmadụ nke ọma tupu e kwuwe okwu ọlụlụ, mana ọ bụghị ogologo oge mmadụ abụọ matara onwe ha bụ isiokwu,"" Jasmine kwuru. ""Ihe mere m ji kweta ịlụ David Moundz bụ maka na ọ hụrụ m n'anya nke ukwuu."" ""Ọ na-enye m oge ya, ma mgbe ọ nọ n'ụlọ, ma mgbe ọ nọ n'ọrụ, oge niile mụ na ya na-akpa n'ekwentị."" ""Ya kpatara m ji sị na nwoke a na-enye m oge ya niile kwesịkwara ka m nye ya oge m."" Jasmine kwuru na nna ya bụ Mr Ibu, na ndị ezinụlọ ya niile nabatara David Moundz dịka di ya. ""Ihe ka ha mkpa bụ ịhụ na m na-enwe obi aṅụrị oge niile. Ebe ha ma na nwoke a na-enye m obi ọma, ha kwadoro mụ na ya."" Chioma kwuru na ya anaghị egosi ihu di ya na soshal midia, maka na ọ chọghị ka ihe niile gbasara ya dịrị n'ọba ịntaneetị. Mana ọtụtụ malitere ikwu na o nwereike ịbụ na nwoke ahụ alụbuola nwaanyị mbụ, nke mere o ji ezo ihu ya ezo. ""Alụghị m di mmadụ, maọbụ enyi nwoke mmadụ,"" Chioma kọwara. ""Di m alụbeghị nwaanyị mbụ na ndụ ya."" ""Kama ọ bụ m kpebiri na achọghị m itinye ihu ya na soshal midia."" ""Mana enyela m BBC Igbo ikike ka ha gosi ihu ya n'onyonyo a."" Oge akụkọ a wuru na soshal midia n'ọnwa Febrụwarị 2022, ọtụtụ kwuru na Jasmine na-alụ nwoke a n'ihi ego ya, maọbụ n'ihi na ọ chọrọ inweta akwụkwọ iji gafee mba Amerịka. Ọtụtụ kwukwara na ọgaghị ete aka mmadụ abụọ a ekewaa. Mana Jasmine kwuru na ịhụnanya ya na di ya siri ike nke ukwuu. ""Onweghị ihe ga-adị ka obi mgbawa na ọlụlụ di na nwunye anyị, naanị obi aṅụrị na ihe ọma ka anyị ga na-enwe,"" ka o kwuru. Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo na Chukwunaeme Obiejesi." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61341021 +sports Fury vs Wilder II: Tyson na Deontay ekwetela izute onwe ha ọzọ "Ndị otiọkpọ abụọ a ma ama bụ Tyson Fury na Deontay Wilder ekwetala izute onwe ha ọzọ. Ọgụ a ga abụ n'obodo Las Vegas nke mba Amerịka ka ọ ga-adị mee, n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2020. Ọ bụ ọgụ nke a ka a ga-eji amata mbe abụọ nke bụ oke. Cheta na Fury na Wilder zuteburu onwe ha n'ọnwa Disemba nke 2018. N'ọgụ nke ahụ, ha abụọ enweghị onye meriri ibe ya. Nke a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya ka a lụgharịa ya bụ ọgụ. N'akara 'Twitter' ya, Wilder kwuru na ""oge eruola mgbe m ga-emetọpụ ihe m malitere"". ""A ga m agba mbọ hụ na m zara ajụjụ niile."" Wilder nwere ike itufu mgbanukwu WBC ya ma ọ bụrụ na Fury merie ya na Febrụwarị 22. Fury n'onwe ya gwakwara ndị nkwado ya na ya ""ga-akutu Wilder, kụpụ ya mkpụrụ ọkwụrụ n'anya"". Mgbe Fury na Wilder zutere n'afọ gara aga, Wilder kuturu ya n'ala ugboro abụọ mana o bilitere. N'ọnwa June, Fury meriri Tom Schwartz nke mba Jamanị, ma merie Otto Wallin nke mba Sweden n'ọnwa Septemba. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50929015 +entertainment Female DJ: Ime 'DJ' akpọgala m ebe m na-arọghị nrọ ịgaru - DJ Wysei Ịgwọkọ egwu nke Bekee kpọrọ Disc Jockey maọbụ DJ n'aha ịchafụ, abụghị ọrụ dị mfe. Na Naịjirịa, ọ bụ ọrụ ụmụnwoke na-arụkarị. Mana nwaada Igbo, Ebere Iwuagwu, onye e ji DJ Wysei mara, egosila na ihe nwoke na-eme, nwaanyị nwere ike ime ya karịa. Iwuagwu, onye rụrụ n'ụlọọrụ redio, 'Wazobia FM dị na Legọs, malitere ịgwọkọ egwu oge ọ dị afọ iri na asaa. Ugbua onye ọbụla ekwetala na ya bụ nwaada ma ihe ọ na-eme. Gere akụkọ ya n'ihe onyonyo dị n'elu. Ndị mere ya bụ Uche Akolisa na Nnamdị Agbanelo. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-53231593 +business Metal Fabricator: 'O nweghị ụzọ ọzọ e si enweta ego na-abụghị ịrụsi ọrụ ike' Chukwubuike Paschal Udo bụ nwaokorobia igwe na-erubere isi. O nwere ike ịgbanwe igwe ka ọ ghọọ ihe ọbụla ọ chọrọ. Nke a bụ ụzọ o si achụta ihe afọ ga-eri kama ọ ga-anọ nkịtị. Chukwubuike kwuru na ọ bụ naanị site n'ịrụsi ọrụ ike nakwa ịgba mbọ ka nwa ogbenye nwere ike iji baa ọgaranya. Lelee ihe nkiri a dịka BBC Igbo si ewetara gị kwa izuụka. Ndị mere ya bụ Adline Okere na Vining Ogu. https://www.bbc.com/igbo/51825480 +health Stress: 'Enweghị ezumike zuru oke nwereike ibute mgbakasị ahụ na ọnwụ' "Ụfọdụ ọrụ anaghị enye ohere ezumike nke bụ na ndị na-arụ ya bụ ọrụ anaghị enwekarị ohere inweta onwe ha, afọ kwuru afọ. Ọrụ ndị a gụnyere ọrụ ndị uweojii, ndị agha, ndị ọrụ ụgbọelụ na-eme njem, ọrụ ntaakụkọ, ndị ọrụ ahụike, ndị na-azụ ahịa, ndị ọrụ ụgbọala, ndị na-ere nri, ndị ọgbatumtum na-eme njem na ọrụ ndị ọzọ. E nweghi ezumike zuru oke n'ọrụ na-ebute ọtụtụ ihe dị iche iche n'ahụ mmadụ. Ọ bụghịkwa naanị ọrụ na-ebute mgbakasị ahụ bụ nke Bekee na-akpọ 'stress', mkpa ezinaụlọ, etu i si eri nri nakwa ọnọdụ ahụike gị nwekara ike itinye aka ụfọdụ oge. Ọ na-ebutenwu ọbara mgbalielu, ọ na-emekwa ka shuga dị n'ọbara mmadụ rịa elu, ọ na-emekwa obi ịkụ kpum kpum. Ọ nwekwara ike ime ka mmadụ na-eri oke nri ọkachasị nke bu oke shuga, na-ese anwụrụ nakwa na-aṅụ oke mmanya, nke nwereike ime ka mmadụ buo oke ibu. Mgbe ụfọdụ ọ na-ebutekwa mgbakasị ahụ; ịma atụ, onye nkuzi na-enweghị ezumike zuru oke nwereike ị na-enwe ahụmgbakasị ebe ụmụakwụkwọ ya nọ. Dọkịnta na-awa ahụ na-enweghị ezumike zuru oke nwereike ichefu ngwaọrụ dị iche iche n'ime ahụ onye ọ wara ahụ, ebe nke na-adụ ntụtụ nwereike ịdụhie ya n'ihi ọma jijiji. Ịma atụ ọzọ bụ na n'ihe dị ka oge a na-agba Ekeresimesi maọbụ na-eme ụfọdụ emume ndị ọzọ, ndị ọkwọụgbọala anaghị enwekarị ohere izu ike n'ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka ha na-akacha akpata ego. Ụfọdụ n'ime ha na-agba ugboro ugboro ka ha nwee ike ịkpata nnukwu ego. Ụdịrị agwa ahụ na-ebutere ọtụtụ mbere okporoụzọ n'oge ahụ, n'ihi na ụfọdụ na-arahụ ụra ka ha na-akwọ ụgbọala. Nwaanyị riri amusu n'ihe gbasara ahụike ụbụrụisi bụ Pamela Udọka kwuru na enweghi ezumike zuru ezu nwereike ibute agwa ọjọọ dị iche iche. Ọ sị na ọ na-ebute ahụ mgbakasị n'ezinaụlọ, ụlọọrụ nakwa n'ọha. Udọka sị na ""ọ bụ ya mere e ji enye ụmụakwụkwọ na ndị ọrụ oyibo ezumike ma a gụrụ gụrụ"". Ọ sị na enweghi ezumike zuru oke nwekwara ike ibute ọrịa ụbụrụisi dị iche iche. O kwukwara na mgbe ụfọdụ, mmadụ nwekwara ike ịmerụ onwe ya ahụ maọbụ merụọ ndị ọzọ ahụ maka ọrịa ụbụrụisi so na ihe enweghi ezumike na-ebute. Udọka dụrụ ọdụ ka onye ọbụla gbaa mbọ wepụta oge maka ezumike n'ọrụ. O kwukwara na ịrahụ ụra zuru oke bụ ihe kacha mkpa n'ezumike. Ndị ọkammụta kwuru na ịrahụ ụra ihe ruru awa asaa n'ụbọchị dị oke mkpa. Ha kwukwara na onye ọbụla chọrọ ezumike kwesịrị inwe oge ha ga-eji wetuo ekwentị ya n'akụkụ, ọkachasị mgbe ọ chọrọ ịrahụ ụra. Onye ahụ kwesịrị ịkpọ ya mkpa ịhụ na o wepụtara oge ọ ga-eji na-alaba ụra kwa ụbọchị; ọ bụ n'ụtụtụ o, maọbụ n'abalị. O kwukwara na ụlọọrụ ọbụla na-anaghị enye ndị ọrụ ha oge ezumike bụ nke Bekee kpọrọ 'leave', na-agba onwe ha egbe n'ụkwụ." https://www.bbc.com/igbo/articles/cxre3q6yw30o +health Coronavirus: Mba China sị ka anyị ghara ikwu maka Coronavirus - Onye Naịjirịa nọ na China "Dịka ọrịa coronavirus na-abawanye na Chaịna nakwa mba ndị ọzọ, otu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ na mba ahụ emepeela mpio etu ọnọdụ ha n'ebe ahụ si kwụrụ. Chukwunonye (anyị edeghị ezigbo aha ya maka etu ihe si kwụrụ) gwara BBC Igbo na ọnọdụ ha na Chaịna, bụ ebe ọ na-agụ mahadum, adịghị mma ma ncha. ""Nke bụ eziokwu bụ na ị bịa ebe anyị na-akpa nkata n'ekwentị, anyị na-ebe akwa n'ihi na anyị enweghi gọọmentị. Ihe anyị na-anụ bụ na gọọmentị Gana sị na ha ga-ezitere ndị be ha nọ akwụkwọ ebe ahụ Yuan puku iri ka ha jiri na-ego nri. ""Mana o nwebeghi etu anyị siri nụta n'ọnụ gọọmentị anyị. O nwere ndị na-ekwu na gọọmentị sị ka ha dekọta aha ụmụakwụkwọ Naịjirịa nọ na Chaina. Mana ihe anyị chọpụtara bụ na ndị mmadụ ji anyị agbagharị. Nke bụ eziokwu bụ na o nwebeghi ihe gọọmentị Naịjirịa gwara anyị."" N'agbanyeghị ihe Chukwunonye na-ekwu, onyeisi ngalaba na-ahu maka ọdịmma ndị Naịjirịa nọ n'ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa, sị na ha na-agba mbọ maka ndị tọrọ n'obodo Wuhan bụ ebe nje a gbugoro ihe karịrị mmadụ 300 malitere. O dere mbọ ha na-agba n'akara Twitter ya. N'agbanyeghị ihe odoziakụ Dabiri-Erewa dere, Chukwunonye na-ekwusi ike na onweghị onye ha hụrụ. Mana, ọ sịkwa na o nwereike bụrụ makana ọ bụghị na Wuhan ka ya na-agụ akwụkwọ. ""Ọ bụ na Wuhan ka ndị mmadụ tọrọ kpọmkwem. Onye butere ọrịa n'obodo ụlọakwụkwọ anyị dị enwetela ọgwụgwọ."" Ọ sị na n'agbanyeghị nke a, obi adịghị ha mma etu ọ na-enwebeghi ozi ọbụla ha nụtara n'ọnụ ndị na-achị Naijirịa. ""Ọ bụ ndị seputere isi nwereike isị na ha na gọọmentị anyị na-akpa. ""Ọ bụ ihe ihere na obodo dịka Naịjirịa na-ebute Chaịna ego agaghị achọ etu ha na ha ga-esi kwekọrịta mara etu a ga-eji nye aka...ọ bụrụgodi site n'inye ụmụakwụkwọ mkpuchi imi."" Chuwkunonye sị na ha anaghị esinwu ebe ha bi pụọ. ""Onye ọbụla nọ n'ọnọdụ Bekee kpọrọ Quarantine ugbua. ""A na-achọ igbochi mmadụ ịpụ gaa bute nje ahụ."" Ọ sị na ọ bụrụ na ị ga-apụrịrị ị ga-anata akwụkwọ ga-enye gị ikike ịpụ. ""Ị pụchaa lọta, a ga-enyocha gị ahụ ọfụma ma tinyekwa gị na quarantine bụ ebe ị ga-anọ ruo oge ha jiri hụ na ahụ dị gị mma tupu e kwe ka ị gaa ebe ndị ọzọ nọ."" Ọ sị na tupu ị gagharịa n'ebe ha bi, ị ga-eyiriri mkpuchi imi. ""Etu esi eri nri"" Chukwunonye sị na ụlọakwụkwọ ha haziri ndị ọ bụ ọrụ ha ịpụ gaa gote nri na ihe ndi ọzọ ndụ chọrọ. ""Nrị gị gwụ, i tinye akwụkwọ, ndị a họpụtara agaa gote nri."" Ọ sị na a na-eyichi ndị ahụ ahụ ọfụma tupu ha agawa njem a. ""A na-etinyekwa uche n'ebe ha na-aga na ihe ha na-ego iji hụ na ọ dị mma oriri, na-abụghị nke bu ọrịa."" Chukwunonye sị na ọtụtụ mba abịala bịa buru ndị be ha lawa. Mana, otu ihe o kwuru tụrụ anya bụ na mba Chaịna sị ka ha ghara ikwu maka nje a, ọkachasị ma ọ bụrụ ndị ntaakụkọ na-ajụ ajụjụ. O gosiri ozi e ziteere ha site n'ihe mgbasaozi WeChat, na-akọwa na e nwere ndị ntaakụkọ si mba ofesi na-ajụ ụmụakwụkwọ a ajụjụ maka ihe na-eme na Chaịna. Ozi a gwara ụmụakwụkwọ ka ha cheta na ha ekwesịghị ịsa ajụjụ ndị ntaakụkọ, dịka ọ bụ ndị na-ekwuru ụlọakwụkwọ ka ọ dịrị ịsa ajụjụ ọbụla. Site n'ihe Chukwunonye kwuru, ndị nọ na mba Chaịna nakwa ha bụ ndị bịara abịa, ma ihe ha kwesịrị ịma maka igbochi nje coronavirus ifesa ha. Ọ sịkwa na ihe ọ hụrụ bu na ya bụ mba na-agbasi mbọ ike ịhụ na ha meriri ya bụ nje. Na Naịjirịa, minista na-ahu maka ahụike bụ Osagie Ehanire, sị na Naịjirịa dị njikere maka nje Coronavirus. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51354214 +sports "2022 World Cup : E tinyeela Nigeria na 'Group C""" "E tinyeela otu egwu Super Eagles na Group C n asọmpị iji tozuo ị ga Iko Mbaụwa nke ga-amalịte n'ọnwa Oktoba afọ 2020. Mba ha na Nigeria nọ na otu ahụ bụ Cape Verde, Central African Republic nakwa Liberia. Ndị Algeria, Burkina Faso, Niger, Djbouti nọ na 'Group A.' Tunisia , Zambia, Mauritania, Equitorial Guinea, nọ na Group B. Mmadụ itoolu ndị omeiwu Imo steeti a hapụla pati ha mabanye na APC. Nke a na-eme n'ọgbakọ mbụ ụlọ omeiwu steeti ahụ na-enwe kamgbe Hope Uzodinma nke APC banyechara n'oche gọvanọ. Ndị omeiwu ahụ gụnyere: N'ime ọgbakọ a ka osote onyeisi ndị omeiwu ahụ aha ya bụ Okey Onyekanma nọkwara kwuo na ya agbaala arụkwaghị m. Onyekanma ritukwara dịka onyeisioche kọmiti na-ahụ maka etu ndị ọgbakọ ndị omeiwu si aga. Onyekanma kwuru na ihe ya ji aritu n'ọkwa bụ ka onye si mpaghara Ọlụ were ya bụ oche dịka nkwekọrịta ha nwere sị dị. Akụkọ ọzọ malitere ifegharị na onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti bụ Collins Chiji esila PDP baa APC. Mana nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na nke ahụ abụghị ezie. Anyị amachibeghị ọkada na keke - Gọọmentị Legọs Gọọmentị Legọs akọwaala na ha amachibeghị ọkada na keke ịgba n'okporoụzọ awaraawara nakwa akwa mmiri dị icheiche na steeti ahụ. Nkọwa a na-abịa dịka akụkọ malitere ifegharị na-ekwu na a machiela ha. Kọmishọna mgbasa ozi na Legọs bụ Gbenga Omotoso kọwara na ha ka-naeleba anya n'okw gbasara ọkada na keke mana ha enwebeghị mkpebi ọbụla gbasara ya. Omotoso kwuru na akụkọ gbasara mmachị keke ""abụghị eziokwu"". Ụlọikpe kachasị ekpebiela ikpe maka ntuliaka ọkwa gọvanọ steeti Benue nakwa Adamawa. Ha kwuru na Samuel Ortom na Umar Fintiri bụ ndị meriri ya bụ ntụliaka n'otu n'otu. Gọọmentị etiti akpụpụla Mohammed Adoke ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka na iri aka azụ n'okwu gbasara ụmị mmanụ agbidi a kpọrọ 'Malabu oil well'. Adoke bụ onye ji ọkwa Ọkaiwu gọọmentị etiti n'oge Goodluck Jonathan ji ọkwa onyeisi ala. O teela aka gọọmentị etiti boro Adoke ebubo a, mana ọ gbara ọsọ gbaga obodo Dubai. Ndị uwe ojii mbaụwa bụ 'Interpol' mechara nwụchie ya n'ọnwa Novemba afọ 2020 ma kpụlata ya Naịjirịa na Disemba. Mana Adoke ekwuola ugboro ugboro na ya adaghị iwu ọbụla kama na ya mere ihe onyeisiala oge ahụ bụ Jonathan gwara ya ka ya mee. Ọ bụghị naanị Adoke ka gọọmentị etiti gbara akwụkwọ a. Ndị ọzọ gụnyere Aliyu Abubakar, Rasky Gbinigie, ụlọọrụ mmanụ agbidi bụ Shell, ụlọorụ Agip, nakwa ụlọọrụ Malabu. Ndị otu Boko Haram egbuola onye isi otu 'Christian Association of Nigeria' (CAN) nke okpuru ọchịchị Michika dị n'Adamawa steeti. Aha ya bụ Lawan Andimi. Ọ bụ onye ntaakụkọ aha ya bụ Ahmad Salkida kọwapụtara nkea. Salkida kwuru na ndi Boko Haram bepuru Andimi isi, ya na otu onye agha Naịjirịa ọzọ. O kwuru sị: ""Andimi bụ onye isi ụka, nna, nakwa onyendu obodo ya."" Salkida kwukwara na ọ bụ n'ehihie ụbọchị Monde ka e gburu Andimi. Ndi Boko Haram nwụchiri Andimi oge ha wakporo obodo Michika na mbido ọnwa a. Ha gosiri ya n'ihe onyonyoo ebe ọ na-arịọ ka gọọmentị gbatara ya ọsọ enyemaka. Mana enyemaka ahụ abịaghị. Gọọmentị Naịjirịa ekwubeghi ihe ọbụla gbasara nke a. Ọrịa a na-eche na ọ bụ Lassa egbuola ndị dọkita anọ na otu onye ọzọ n'ụlọọgwụ mahadum Aminu Kano nke dị na Kano steeti. Otu n'ime ndị isi ụlọọgwụ ahụ aha ya bụ Imam Bello gwara ndị ntaakụkọ na e zigala ọbara ndị ahụ nwụrụ anwụ ka e nyochaa ya mata kpọmkwem ihe gburu ha. Ị ma na ụfọdụ okwu e jiri mara ndị Naijiria abanyela n'akwụkwọ nkọwa okwu 'Oxford Dictionary' n'afọ 2020? Okwu ndị a gụnyere ọkada, buka, k-leg, agric, danfo, chop chop, barbing salon, dịrị gawazie. Onyeisiala Muhammadu Buhari arịọla mba Briten ka ha nyere Naịjirịa aka nyochaa ndị niile nwere ebubo mpụ na nrụrụaka gbatara ọsọ izendụ na mba ha. Ọ rịọrọ nke a mgbe ya na Praịm Minista Briten bụ Boris Johnson na-akparịtaụka ime ụlọ n'ọgbakọ UK-Africa Investment Summit 2020 a na-eme na Lọndọn ugbua. Nke a dị n'ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu wepụtara dịka ọgbakọ a na-aga n'ihu. Buhari sị na ọchịchị ya na-agba mbọ n'ibu agha megide mpụ na nrụrụaka ma e nwere ụfọdụ ọgbateuhie dị n'ụzọ. N'otu aka ahụ Buhari gwara onyeisiala Gana bụ Nana Akufo-Addo na ihe o ji gbachie okeala Naịjirịa abụghị naanị maka mbubata nri, kama na ịtụ mgbere ngwaagha na ọgwụike sokwa. Akufo-Addo na nzaghachị ya sị ka Buhari gbapụ ya ọsọ na nyocha banyere nke a n'ihi oke uru Naịjirịa baara Ghana. Gịnị ga-eme n'ụlọomeiwu Imo Steeti Anya niile nọ n'ụlọomeiwu Imo Steeti ugbua dịka ha ga-amalite nzukọ ha nke mbụ n'okpuru ọchịchị gọvanọ Hope Uzodinma. Cheta na ndị a gara ezumike Ekeresimesi n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Disemba 2019, mgbe Emeka Ihedioha ji ọkwa gọvanọ. N'ofesi Ndị ọrụ ahụike na mba Chaịna achọpụtala na ọrịa iku ume a kpọrọ Coronavirus nwereike isi na mmadụ fee na mmadụ site mmekọrịta ahụ. Dịka ọ dị ugbua ọrịa a egbuola ihe ruru mmadụ anọ ebe ọtụtụ ndị gụnyere ndị ọrụ ahụike nọ n'ọnọdụ ọjọọ. Taa ka o mere otu afọ kpọmkwem ọgba bọọlụ bụ Emiliano Sala lara mmụọ dịka ụgbọelu ya kpọkasịrị oge o si mba Fransị na-aga otu egwuregwu ọhụrụ ya bụ Cardif City. Na mkparịta ụka ya na BBC, Nne Sala kwuru na ọnwụ nwa ya ka na-agbawa ya obi nke ukwu na-agbanyeghị na ọ gaala otu afọ ya bụ ihe mere. Chelsea chọrọ Cavani Onye nchịkọta Chelsea bụ Frank Lampard ekwuola na uche ya dị n'ịzụ Edinson Cavani bụ onye chọrọ isi na PSG pụọ. Lampard sị na Chelsea kwesịrị mwulite ka ha nwee ike tozuo oke n'asọmpi Champions league afọ na-abịa. Nkeji Ihe nkiri" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51187297 +sports Arsenal vs Chelsea: Chelsea agbajiela Arsenal aka napụ ha nri n'ọnụ Chelsea ekweghi Arsenal zọọ ha mpịtị mpị ka ha zutere n'ọgbọegwuregwu Emirates. Goolu Tammy Abraham nyere na nkeji 87 na nke Jorginho nyere na nkeji 83 zuru iji tinye Arsenal n'ọnọdụ akwa arịrị na be ha. N'agbanyeghi na Pierre-Emerick Aubameyang nyerela Arsenal goolu na nkeji 13 e ji bido bọọlụ, o zughi ịkpọ ndị Chelsea ntu n'obi. Ka a batara ọkara nke Abụọ, ndị Chelsea gara n'ihu ka ebule e tinyere mma n'olu, wee jiri ajụ ọnwụ gbanye Arsenal goolu abụọ iji wee naghara ha pọịntị atọ. Ha ji mmeri a wee sị Mikel Arteta gbabuuru Arsenal bọọlụ ma bụrụ onye nchịkọta ọhụrụ ha 'nnọọ'. Ka ọ dị ugbua, Chelsea ji pọịntị 35 ka nọ n'ogogo anọ na tebulu Premier League, ebe Arsenal ji pọịntị 24 nọ n'ogogo 12. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50941364 +health World Blood Donor Day: Tupu inye mmadụ ọbara, buru ihe ndị a n'obi Ọbara bụ otu njirimara onye dị ndụ. Kama ụfọdụ ọrịa na ihe mberede na-eme ka ọbara nọ n'ahụ mmadụ pee mpe. Akụkọ a ga-akọwara gị mkpa ọ dị na ndi mmadụ nyere ọbara ha n'efu iji zọọ ndụ ndị mmadụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-57482799 +politics National Consultative Front: Pat Utomi akọwaala ihe dị n'ime ya BBC gbara Pat Utomi ajụjụ ọnụ maka 'National Consultative Front' bụ otu ọhụrụ ha chọrọ ihibe. O kwuru na ya bụ otu were ọtụtụ mmadụ si ebe dị iche iche na Naịjirịa. Utomi sịkwa na ha tụrụ anya ịhazigharị usoro ọchịchị na Naịjirịa. Gee ya ntị n'uju ebe a: Akụkọ ndị a ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-53274798 +health Coronavirus Lockdown: 'Gọọmentị Amerịka nyere anyị ihe anyị ga-eji nọrọ n'ụlọ' Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebe akwa na Naịjirịa na gọọmentị enyeghi ha ihe iti aka n'obi dịka e mechiri obodo n'ihi coronavirus. N'oge a, ọtụtụ enweghi ọkụ ne be ha, ha enweghị ihe oriri nakwa ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka. Mana ndị Naịjirịa bi na mba Amerịka na-ekwu na gọọmentị obodo ahụ nyere ha ihe niile dị ha mkpa iji nọrọ n'ụlọ. Lee ezinụlọ a gwara BBC Igbo etu ha si nọrọ n'Amerịka. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-52217328 +sports Salwa Eid Naser: Nwa afọ a gbajọrọ Nigeria ga tụtara Bahiain ugo ọlaedo n'asọmpị IAAF "Ọbụghị Salwa Eid Naser ka nne na nna ọgbọsọ a dị afọ 21 kpọrọ mgbe amụrụ ya. Nwa agbọghọ a gbafere Miller-Uibo ma merie asọmpị ọsọ 400m nke ụmụnwaanyị na ""IAAF World Athletics Championships"" nke 2019 bidoro ndụ ka Ebelechukwu Agbapuonwu. Nwa ada Naser na-agbaburu Naịjirịa ọsọ tupu o nyefe nkwado ya mba Bahrain. Ka o meriri unyaahu, ọ sị; ""Nke a na-agbaka isi! ""Ọ bu sọso olilanya ime ọfụma mana ugbua atụọla m ugo."" N'afọ 2017 Naser ritere ọra nchara na IAAF agbara na London. Mgbe ahu ọ sị na ya enweghi ihe o ga-agwa ngalaba na-ahụ maka ndi ọgbọsọ na Naịjirịa." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49924873 +business Mizwanneka: Ndị sị na m ji 'juju' ere ahịa m amaghị ahụhụ m tara kamgbe afọ asatọ gara aga - Nwanneka Nkumah Nwanneka Nkumah (Mizwanneka), onye nwe Nwanneka Luxury Hair, kọọrọ BBC etu o si malite njem ya dịka onye na-ere ntutuisi na Instagram. Ọ kọkwara gbasara ebubo ụfọdụ na-ebo ya na o ji juju ere ahịa ya. Mizwanneka kwuru na o karịala afọ asatọ ọ malitere ire ntutuisi na Instagram iji hapụ ịnọ nkịtị na be di ya. O kwukwara na ọ bụ di ya nyere ya nnukwu nkwado o ji malite. Gere akụkọ ya n'uju n'onynyo a. Onye mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanel https://www.bbc.com/igbo/afirika-56273080 +entertainment Merry Christmas: Lee emume eji eme 'Christmas' tupu a mụọ Jizọs "Ekeresimesi bụ emume ndị okpukperechi Kraịst ji echeta ụbọchị a mụrụ Jesus Christ, bụ onyeisi nakwa onye hibere ya bụ bụ okpukperechi. Nke a pụtara na ụfọdụ kwenyere na tupu a mụọ Jesus Christ, enweghị ihe ọbụla dịka emume Ekeresimesi. Mana ndị ọkammụta na ndị nchọcha na-ekwu na e nwere ọtụtụ ihe ama na-egosi na ndị mmadụ emebuola ememe 'Christmas' ihe dị ka puku afọ asaa tupu amụọ Kraịst. N'akwụkwọ 'Religions of Rome', ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ Mary Beard na John North dere ka ha na-echeta na oge a bụ oge emume 'solstice' chi a na-akpọ Mithra ka eji ya echeta. Akwụkwọ ha kọwara na ọ bụ otu izu ka eji emume a nke na-adị n'etiti ezinụlọ, ọ bụkwa oge eji enye onyinye dị cihe iche n'etiti ndị mmadụ. Ya mere, ọ dịghị ihe dị iche na enmume a na ekeresimesi nke oge a. Site na akụkọ ifo ndị Peshia, Mithra bụ chi amamihe, na-anọchi anya ihe ya na ịdị mma karịa ihe ọjọọ. Mithra bụkwa chi nke ya na anyawnụ na emekọ, akụkọ na emeghịe eme na ekwu na ọ na-anya ụgbọ ịnyịnya ya aga njem kwa ụbọchị na mbara igwe iji weta ihema yie ike ochịchị egwu. Ihe kpatara ya bụ na Eze Ukwu Rom Lucius Domitius Aurelian (214-275), kpebiri ịhazi mmeme dịka etu ndị agha mba Rom si emebu. Mara na oge ochie, ọ bụ ọtụtụ emume ha na-eme bụ chi ndị dị iche iche ka eji ha echeta. Ụfọdụ mmemme ndị a ka eji echeta oge udu mmiri maọbụ oge ọkọchị. Eziokwu bụ na enweghị onye ma ụbọchị amụrụ Kraịst kpomkwem. Dịka ọkammuta ihe mere eme bụ Gerson Leite de Moraes siri kwuo, "" Anyị amaghị ụbọchị maọbụ afọ amụrụ karaịst. ihe edere n'akwukwọ bịara dịka afọ iri anọ kamgbe kraịst nwụrụ"". Eze mba Rome abụọ bụ Flavio Valerio Constantina (@72 - 337) na Flavio Teodosio (346-395) bụ ndị nyereaka hụ na ehiwere emume Ekeresimesi. Gerson Leite de Moraes kwuru sị, "" Ofufe Kraịst sitere na ofufe ndị a na-achọ ka egbuo were bụrụ ofufe ndị mba Rom niile"". Ọ gara n'ihu kọwaa, "" Dịka a na-ahụ Jesu dịka ihe nke ụwa, e jiri emume eji ncheta ọmụmụ Kraịst were dochie emume ncheta chị Anyanwụ bụ emume a na-akpọ Sol Invictus ( Nke pụtara ọmụmụ anyanwụ) na mba Rom. Nke apụtara na emume ncheta Kraịst nke ụbọchị 25 ọnwa Disemba niile bụ abụghị ihe achọpụtara achọpụta, kama ọ bụ site na nkwekọrịta ka ya bụ emume jiri bido. Gerson Leite de Moraes kwukwara sị, "" Mgbe ụka nke Kraịst na-ebido, ha ji ụfọdụ emume arụsị efe ofufe iji gosi na ụfọdụ omenala ka dịkwa ire. Kama kedụ mgbe a mụrụ Jịsọs Kraịst n'eziokwu? Ndị kammụta kwetara na-enweghị etu a ga-esi chọpụta mgbe a mụrụ Kraịst. Ọkammụta ihe mere eme bụ André Leonardo Chevitarese kwuru sị, "" Anyị amaghị mgbe a mụrụ Jesu Kristi. kama a na-eche na ọ ga-abụ mgbe ọchịchị Eze Herod nke Ukwu na-abịa na njedebe.Ihe dịka afọ nke anọ maọbụ nke isii tupu oge 'Common Era'"". Morase kwuru sị, "" iji emume ofufe ọhụrụ dochie nke omenala bụ ihe a na-eme karị oge ochie"". Ọ bụ Pope Julius nke mbụ hiwere emume Ekeresimesi, dịka o ji ya dochie emume ncheta ụbọchị eji efe anyanwụ dịka iwu n'afọ 350. O ji atụmatụ mekpaa ofufe anyanwụ ahụ."" Chevitarese kwuru sị, "" Dịka ọ dị ugbua, Kraịst na emume Sol Invictus bụ otu make emume a a na-eme n'ụbọchị 25 nke ọnwa Disemba afọ ọbụla." https://www.bbc.com/igbo/59789208 +politics Anambra election 2021: Ị ma ka ị ga-esi achọta ebe ị ga-ebinye aka dị gị nso? Dịka ị na-akwado maka ịga binye aka n'akwụkwọ pati nke ị na-akwado, lee ihe niile ị kwesịrị ịma maka ebe ị ga-aga ebinye aka, etu ị ga-esi ebinye aka, nakwa ihe ị kwesịrị iji aga. https://www.bbc.com/igbo/afirika-59034612 +sports AFCON 2019: Mba ga-emeri n'ihe ndị ọzọ abụghị egwu bọọlụ . https://www.bbc.com/igbo/afirika-48884313 +health Mental Health Awareness Week: Psychosis, Bipolar disorder na ọrịa isi ndị ọzọ ị kwesịrị ịma maka ya "Ọtụtụ oge ka ndị ọ na-edoghi anya na akpọ ndị nwere ọrịa isi ""ndị isi mgbaka"". Mana ọ bụ ọrịa isi niile bụ 'isi mgbaka'? Akụkọ a na-akọwa etu ọrịa isi dị iche iche na-esi emetụta ndị mmadụ na etu o si dị iche n'isi mgbaka. Site n'ụbọchị itoolu ruo 15 nke nke ọnwa Mee afọ 2022, bụ oge a họpụtara maka nkọwa na mgbasaozi maka ahụike nke a kpọrọ 'Mental Health Awareness Week' na Bekee. A wepụtara ụbọchị a iji gbaa tọọchị n'ihe gbasara ọrịa ndị na-emetụta isi, nke gụnyere ọrịa ụbụrụ, ọrịa uche wdgz. Psychosis: Nnyocha ngalaba ahụike mba UK a kpọrọ 'National Health Scheme' (NHS) kọwara ọrịa a kpọrọ 'psychosis' dịka mgbe mmadụ na-ahụ ihe na-eme n'ụwa a dịka ọ na-eme n'ụwa ọzọ. Nke a gụnyere ịhụ ihe ndị ọzọ nọ gị nso anaghị ahụ nakwa ịnụ ihe ndị ọzọ anaghị anụ (Bekee kpọrọ hallucinations), nakwa ikwenye n'ihe ndị emeghi n'eziokwu, ọkachasị na mmadụ bu n'obi imerụ ha ahụ (Bekee kpọrọ ya delusions). Ụfọdụ oge onye na-arịa psychosis anaghị ama na ọ bụ naanị ya ka ihe na-eme na-eme; ụfọdụ ndị nọ ha nso na-eche na isi agbakaala ha. Ihe na-ebute psychosis gụnyere: Ọgwụgwọ psychosis: Psychosis na-abịa abịa na-ala ala dịka onye ọbịa, mana ọ naghị alakarị kpamkpam. Nlekọta onye na-arịa psychosis gụnyere ịṅụ ọgwụ nke ụlọọgwụ na-enye. Ọrịa 'Bipolar Disorder' NHS kọwara 'Bipolar disorder' dịka ọrịa na-emetụta ụbụrụ nke nwereike ịgbanwe ọnọdụ mmadụ n'otu ntabi anya. Onye na-arịa ọrịa ụbụrụ a nwereike inwe nnukwu obi aṅụrị n'otu mgbe nke nwereike igbanwe ma bụrụ ọnọdụ mwute ozugbo. Ndị na-arịa ọrịa ụbụrụ a na-ahụta ihe ndị dị etu a: O nweghi onye ma kpọmkwem ihe na-ebute ọrịa Bipolar, mana ọtụtụ ihe gụnyere oke nchekasị, oke ndọga, oke nsogbu ụwa nakwa ihe ndị na-agbanwe ndụ (dịka ihe mberede a kpọrọ trauma), nwereike ịkpali ya. N'afọ 2021 ka otu onye ejije a ma ama bụ Cha Cha Eke kwuputere na ọ na-arịa ọrịa Bipolar , nke mere ka o wusaa ebe niile. Ọrịa Dementia Ọrịa Dementia bụ ọrịa uche na-emetụta akụkụ ụbụrụ a kpọrọ 'Hippocampus' nke bụ ụzọ e si abanye ihe jikọrọ echiche. Ọrịa a na-emetụta ndị mmadụ dịka ndị na-arịa ya na-echefukarị ihe. Ọ na-emekarị ndị merela okenye maka na ọ bụ ọrịa na-abịa n'agadị. Ọrịa isi ndị ọzọ gụnyere: Obsessive Compulsive Disorder (OCD) Ọnọdụ a na-eme ka mmadụ nwee echiche ime ihe na anaghị ekwe apụ n'uche onye ahụ. Ọnọdụ ahụike a nwereike ịkpalite mgbakasị ahụ dịka onye ga-achọrịrị ime ihe ọbụla gbatara ya n'uche. Ọnọdụ a nwereike imetụta ụmụnwoke, ụmụnwaanyị nakwa ụmụaka. Ndị bu ọnọdụ a nwereike ịnata ọgwụgwọ sịte n'ịṅụ ọgwụ nakwa usoro enyemaka ndị ọrụ ahụike ụbụrụisi nke Bekee na-akpọ ""psychological therapy"". Autism Autism bụ otu ọrịa na-emetụta mkparịtaụka nakwa akparamagwa . Ọtụtụ oge ndị mmadụ na-aghọtaghie ya dịka ara. 'Autism na-emetụta ụbụrụ isi ndị mmadụ ọkachasị mgbe mmadụ ka na-eto eto. O dochabeghi ndi ọkacha mara anya ihe na-akpata ya bụ ọrịa, mana nnyocha egosila na ụbụrụ ndị nwere 'autism' na nke ndị ọzọ anaghị abụcha otu ihe. Mana ọ dị mwute na ọtụtụ na-akpọ ndị nwere ọria a 'imbecile' ma were ha na-eme ihe ọchị. Nke a jọgburu onwe ya. Ndi nwere 'autism' bụ mmadu zuru oke ma nwee uche zuru oke. Post-Traumatic Stress Disorder Nke a bụ ụdị ọnọdụ obi mmapụ na ụjọ nke Bekee na-akpọ ""anxiety"". Ndị mmadụ na-adaba n'ọnọdụ a site n'ihe dị oke egwu maọbụ ihe mkpagbu na obi mmapụ mere mmadụ n'oge gara aga. Ọnọdụ a nwereike ime ka mmadụ ghara ịrahụ ụra. Ụdịrị ihe ndị mere mmadụ nwereike ịkpalịte ọnọdụ a bụ: Ihe mberede, mwakpo n'aka ndị ọjọọ, mwakpo maọbụ ndịna n'ike, ọnọdụ dị egwu n'ịmụ nwa wdgz. Ndị bu ọnọdụ a nwereike ịnata ọgwụgwọ sịte n'ịṅụ ọgwụ nakwa usoro enyemaka ndị ọrụ ahụike ụbụrụisi nke Bekee na-akpọ ""psychological therapy""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61407212 +health Ọrịa mmekọ nwoke na nwaanyị ị ga-ebuteli site n’ọnụ "Ọtụtụ mgbe ndị mmadụ nụ maka ọrịa mmekọ nwoke na nwaanyị a na-eche na ọ bụ naanị mgbe ihe nwoke jiri bụrụ nwoke metụtara nke nwaanyị. Mana ndị ọrụ ahụike ekwuola ugboro ugboro na mmadụ nwereike ibute ọtụtụ ọrịa site n’ịmị ọnụ maọbụ iji ọnụ tinye n’akụkụ ahụ nwoke maọbụ nwaanyị dịịrị onye ahụ. Ọrịa na-ebutekarị site n’ụzọ ọnụ a bụ ọrịa ‘gonorrhea’ na ‘syphilis’. Otu onye dọkịnta aha ya bụ Udodi Okoli kọwara BBC Igbo ihe dị mkpa banyere etu e si egbochi ọrịa ndị a. Gonorrhoea: Ọrịa a so n’ọrịa ndị mmadụ nwereike ibute ma nwoke na nwaanyị maọbụ nwoke na nwoke nwee mmekọ na-ejighị okpu nna bụ enyị mana mmekọ a gụnyekwara ịmị ọnụ maọbụ itinye ọnụ n’akụkụ ahụ ma-enyeghị okpu nna bụ enyị. Nnyocha ụlọọrụ NOIPolls mere na 2020 gosiri na naanị pasentị 34 ndị tozuru oke mmekọ na-eji okpu nna bụ enyị n’oge mmekọ ha. Okoli kọwara na ọrịa a na-arị elu aghara aghara na Naịjirịa ma kwuo “Ndị ntorobịa na-eleghara ihe ga-echekwa ha anyị” O kọwakwara na njiri mmara ọrịa a n’ahụ mmadụ gụnyere isi n’amụ maọbụ otu na-anyụpụta mmiri na-acha edo edo maọbụ ka akwụkwọ nrị. Ihe ndị ọzọ gụnyekwara oke mgbu ma mmadụ na-anyụ mmarị nakwa nwaanyị ịgba ọbara n’oge ọ nọghị na nsọ ya, ọkọ n’ime ike mmadụ. Mana o kwukwara “Njiri mmara ọrịa a naghị egosi onwe ya n’utu nwaanyị maọbụ n’ike onye bu ya”. Dịka Okoli si kwuo, mmadụ hapụ ọrịa a n’ahụ ya ma ghara ịlebara ya anya ruo oge dị anya, o nwereike ibutere onye ahụ ọnọdụ amụghị nwa, nakwa ọrịa ọzọ a na-akpọ ‘pelvic inflammatory disease’. Dọkịnta Oderinde Wunmi kọwara na ụzọ mmadụ nwereike isi chekwawa onwe ya n’aka ọrịa a bụ: Syphilis: Ọrịa a sokwa na ọrịa mmadu nwereike bute site na mmekọ eji ọnụ eme. Oderinde kọwara na njirimara ọrịa a gụnyere ọnya ịwụkasị mmadụ n’akụkụ ọnụ maọbụ n’akụkụ utu nwoke maọbụ nwaanyị, ike ọgwụgwụ, isi ọwụwa na ahụ mgbu nakwa ahụ mmkpomọkụ. Oderinde kwusiriike “Nd��� mmadụ kwesịrị ima na a na-ebute ọrịa a aghara aghara site n’itinye ọnụ n’akụkụ utu nwoke maọbụ utu nwaanyị” “Ụfọdụ chere na ma ọ bụrụ na ihe nwoke jiri bụrụ nwoke abanyeghị ahụ ha na agbalahụla ọrịa a mana nke a bụghị eziokwu”. Okoli tinyekwara ọnụ n’okwu a gbaa ama ihe Oderinde kwuru. Ọ gara n’ihu kọwa na mmadụ ghara ịlebara ọrịa anya n’ahụ ya ruo oge dị anya, onye ahụ nwereike ifeba n’ụbụrụisi onye ahụ ma butekwa ọnwụ. Dịka ọrịa Gonorrhoea, ụzọ mmadụ nwereike isi chekwawa onwe ya n'aka ọrịa a gụnyere: HPV: Ọrịa a nke aha uju ya na Bekee bụ ‘human papillomavirus’ sokwa n’ọrịa ndị mmadụ nwereike ibute site n’iji ọnụ mee mmekọ nwoke na nwaanyị. Ọrịa a anaghị ebutekarị njirimara n’agba n’ọha ọ bụla – mana o nwereike ịkpata ihe dịka otutu (warts) n’akụkụ utu nwoke maọbụ utu nwaanyị, n’ime ọnụ  maọbụ n’aka nakwa ụkwụ. Nke a mere na ọtụtụ ndị mmadụ agaghị ama na ha bu ọrịa a. Otu ihe dị mkpa bụ na ọrịa a, n’ọtụtụ oge n’eji aka ya ala n’ahụ mmadụ mana ụdịrị ọrịa a nke dị njọ nwereike ibutere mmadụ ọrịa akpụ (cancer). Otu ahụike ụwa bụ WHO ekwuola na pasentị 90 ụmụnwaanyị nọ n’ọnọdụ ọrịa akpụ nke utu (Cervical cancer) na mba ndị na-enweghị ka ọ hara ha butere ya site n’ọrịa HPV. A na-akacha ebute ọrịa a na-efe efe nke ukwuu site na mmekọ ejighi okpu nna bụ enyi mee. Okoli kwuru na nwoke ọbụla marala nwaanyị maọbụ nwaanyị ọbụla marala nwoke enwerela ike ibu ọrịa a. O kwukwara na e nwere ọgwụ mgbochi ọrịa a mana a na-enyekarị naanị ya ụmụ ntorobia na-agafebeghị afọ 18. Herpes: Herpes so n’ọrịa a na-ebute site na mmekọ nke gụnyere nsusu ọnụ nakwa itinye ọnụ n’akụkụ utu nwoke na nwaanyị n’oge mmekọ. E nwere ụdịrị Herpes dị iche iche nke gunyere ""Herpes Simplex virus type 1 (HSV-1) na ""Herpes Simplex virus type 2 (HSV-2). Oderinde kwuru: “Anaghị agwọ ọrịa herpes agwọ mana enwere ọgwụ ndị bu ya ga-esi nyere onwe ha aka.” I jị maa atụ , HSV-1 na-emekarị n'ọnụ ebe HSV-2 na-eme n'ike, ọtụ maọbụ amụ. O kwukwara na “mmadụ were ọnụ ya metụ onye bu HSV-2, HSV-2 nwereike ime ya n'ọnụ”. “Eziokwu bụ na ọbụghị iwu na mmadụ ga-edina mmadụ tupu o bute ọrịa herpes”. WHO kọwara na ọrịa a nwereike ịghara igosi onwe ya n’ahụ onye bu ya mana njirimara ya gụnyere: Ọnya n’akụkụ ọnụ maọbụ n’akụkụ utu. Mana Okoli kwuru, “Ọ bụghị kwa iwu na mmadụ ga-ahụ ọnya tupu ị mara na ị bu ọrịa Herpes n'ihi na onwere ike izo n'ahụ mmadụ”. “ Ime nnyocha ime ahụ kwa mgbe kwa mgbe maka ọrịa enwereike isi n’aramara bute dị ezigbo mkpa” Ọ gara n’ihu kwuo: “nchọpụta ọrịa ndị a n’oge n’ahụ mmadụ dị mkpa maka ịmalịte ọgwụgwụ nke ga-azọ ndụ mmadụ”. Na nchịkọta, o kwuru na ọrịa ndị ọzọ mmadụ nwereike isi na mmekọ eji ọnụ eme bute gụnyere: Chlamydia, Hepatitis A, B na C, HIV , Monkey Pox wdgz. Oderinde kwuru na ""Umụnwoke na-edịna ụmụnwoke na-adanyekarị n'ọnwụnwa ịghara iji okpu nnabụenyị mee mmekọ maka ha anaghị atụ ụjụ ituru ime."" ""Ọzọ kwa bụ na mfesa ịṅụ ọgwụike n'etiti ndị ntorobịa arịala elu nke mere ka ha ghara itinye uchu n'ịchekwa onwe ha etu ha kwesiri n'oge mmekọ""." https://www.bbc.com/igbo/articles/ceql8l8w1xdo +business Working From Home: Ụzọ asaa ị ga-esi baara onwe gị uru ma rụọ ọrụ n'oge mmachi maka coronavirus "Dịka ọtụtụ mmadụ nọ n'ụlọ na mba dị iche iche nke gụnyere Naịjirịa mere mmachi ngagharị na nnọkọ mmadụ maka ọrịa coronavirus, ọtụtụ ndị mmadụ amaghị etu ha ga-esi eme n'ihi na ịnọ n'ụlọ amaghị ha ahụ. Kama, echegbula onwe gị n'ihi na anyị na-ewetere gị ụzọ asaa ị ga-eji baara onwe gị uru dịka ị si n'ụlọ arụ ọrụ n'oge mmachi a. Ihe atọ ị kwesịrị ị bụ n'obi dịka ị si n'ụlọ arụ ọrụ bụ Nghazi, oge mmecha na ezumike. Ọ bụ site na ihe atọ ka ụzọ asaa a sị pụta. 1) Chọta nkọrọ dị ahụ gị mma: Oge eruola ị ga-eji hazie obere ebe ị ga-akpọ ụlọọrụ n'ụlọ gị. Chọta ebe dị ahụ gị mma nke mmadụ agaghị enye ndụ gị nsogbu. Gba mbọ hụ na ihe na abata ebe ahụ nke ma. Ma ya bụrụ kwa ebe ụbụrụ gị ga-edere duu ka ị rụọ ọrụ gị nke ọma. 2) Ekwela ka enwee ihe ga-arafu uche gị : Ọ bụrụ na mmadụ anọghị n'ụlọ ọrụ ya, itinye uche na ihe ọ na-eme na esi ike n'ihi na ọtụtụ ihe nwere ike irafu uche gị. E nwere ìgwè na adị n'ime ekwentị ga-enyere gị aka ka uche gị hapụ ị pụ n'ọrụ. Maka Ihe gbasara iru ọrụ nke ọma igwe aap dịka ""cold turkey"", ""proud"" na ""rescue time"" ga enyere gị aka. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na ndị ọrụ gị rụkọọ nke ọma igwe aap dịka ""zoom"", G-suite"", ""Bannersnack"" na ""slack"" ga enyere aka nke ukwu. 3) Hazie ụbọchị gị ma tinye uchu na ihe ndị kacha mkpa: Ọ dịkwa ezigbote mkpa ka ị were atụmatụ iji arụ ọrụ n'ụlọ ọrụ were ya na-arụkwa ọrụ ugbu a ị nọ n'ụlọ. Ọ dịkwa mkpa ka ị bido n'ụtụtụ hazie ụbọchị gị, wepụta oké ị ga-eji rụọ ọrụ dịka ị na edetu ihe niile ị ga-eme n'ụbọchị ahụ. 4) Hụta na ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ ghọtara gị mgbe niile: I si n'ụlọ arụ ọrụ dị iche nke mere na ọ dị mkpa na ị hụrụ na ndị gị na ha na-arụkọ na-ghọta gị mgbe ọbụla. Ịkpọ na ekwe ntị nke ihe onyonyo kpọrọ ""video call"" na enyere aka nke ukwu. Ọ dịkwa mkpa na ị jụrụ ajụjụ mgbe ọbụla enwere ihe ị na-aghọtaghị. 5) Kwado nke ọma tupu ị banye ọgbakọ n'ekwenti: Gbaa mbọ hụ na ị kwadoro onwe gị nke ọma tupu ị banye n'ogbakọ ekwe ntị. Hụ kwa na ihe nwere ike irafu gị dịka ìgwè onyonyo tivi, redio ma ọbụ ndị ọzọ gbanyụrụ agbanyụ. Ọ dịkwa mma ma ahọpụta otu onye ka edu ndị ọzọ na nzukọ ahụ. 6) Nye onwe gị oge ezumike nri : Gbalịa hụ na ị nyere onwe gị oge ezumike ị ga-eji rie nri dịka ị si n'ụlọ arụ ọrụ. Nke a ga-enyere aka ka ụbụrụ gị zuo ike. Erikwala nri dịka nzukọ na-aga. Isi nri nke gị bụ kwa ezigbo ohere inye onwe gị ezumike. 7) Echefu kwala izu ike: mmadụ abụghị ìgwè. Gbalịa hụ na ị zuru ike. Were ohere ezumike a, hazie ụlọ gị, kpọtụrụ ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị n'ekwe ntị, maọbụ mụọ ihe ọhụrụ. Ihe kacha mkpa bụ na ị nyere onwe gị oge ezumike." https://www.bbc.com/igbo/afirika-52182506 +religion 2020 Prophecies: Ihe Bishop Katọlik gwara Mbaka maka amụma o buru n'isi Hope Uzodinma "Ụfọdụ ndị ụkọchukwu Katọlik na ndị ntorobia Imo steeti etinyela ọnụ n'ịkatọ amụma Fada Ejike Mbaka kwuru ebe ọ sị na Hope Uzodinma zọrọ oche n'okpuru APC, ga-eweghara ọchịchị steeti ahụ n'afọ a. Bishop dayọsis katọlịk dị n'Ụmuahịa bụ Luscious Ugorji kwuru na ụka katọlịk ebe Mbaka bụ ụkọchukwu ""anaghị agba afa ka ndị dibịa"". ""Nke mere na ha adịghị enye ndị ụkọchukwu ha ikike ikpebi onye ga-emeri n'ikpe dị n'ụlọikpe."" dịka ụlọ mgbasaozi ""Sun newspaper"" si depụta. N'otu aka ahụ, ndị ntorobia nke Isdore Chukwuemeka na-anọchiteanya ha, kwukwara sị ka Mbaka hapụ gọvanọ Emeka Ihedioha aka n'ihi na ndị mmadụ tụnyeere ya makana ọ masịrị ha, ma kwuo na ọrụ Ihedioha na-arụ n'Imo masịrị ha. A gba m aka ka m gbuchara enyi m nwaanyị: Adeeko Owolabi bụ nwataakwụkwọ dị afọ iri abụọ na atọ e jidere maka iso kpaa nkata igbu enyi ya nwaanyị, ekwuola na ọ hụghịdị ihe o ji maka ya kpaa arụ a. Owolabi kwuru na o gburu Favour enyi ya nwaanyị ka o jiri ya gwọọ ọgwụ ego, mana ka ọ gwọchara ya bụ ọgwụ, o jighi rose, o jighi ndawịị. Ọkụ gbara n'Ọyọ steeti Ọkụ agbapịala ngwongwo ndị mmadụ ruru nde kwuru nde naịra n'ahịa dị n'obodo Akesan dị n'Ọyọ steeti. Ka ndị mmadụ na-ewe iwe ọkụ ọgbụgba ahụ, mgbọ tụrụ otu nwatakịrị dị afọ iri na anọ ebe ahụ, kama ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ha na-achọ onye gbapụrụ mgbọ ahụ makana o sighi n'aka ndị otu ha. Ọkụ na-agba n'Ọstrelia Ndị mmadụ atụkọtala nde dọla iri na atọ n'ime ụbọchị abụọ, a ga-eji nyere aka menyụọ ọkụ oke ọhịa na-agba n'obodo New South Wales dị na mba Ọstrelia, dịka onye ọkpaọchị a ma ama bụ Celeste Barber rịọrọ arịrịọ. Ọkụ a ataala isi ihe ruru mmadụ iri abụọ na anọ ma chụpụ ihe karịrị puku iri abụọ n'ụlọ kemgbe ọ malitere. N'egwuregwu, Liverpool na Everton ga-ezute ọzọ n'ọgbọegwuregwu Anfield ebe ha abụọ ga-ama aka ịmata onye ga-epiobanye n'agba nke anọ n'asọmpi Iko FA. Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs steeti, adụọla ndị mmadụ ọdụ ka ha gbado anya iji gbochie ọkụ ọgụgba n'oge ụgụrụ a. Na ndụmọdụ ya, o kwuru sị ka ndị mmadụ cheta na-agbanyụsị nakwa kwụpụta ihe ndị na-eji ọkụ latrik arụ ọrụ ma ha na-apụ apụ, nakwa gbaa mbọ nwee ihe e ji emenyụ ọkụ nke bekee kpọrọ extinguisher. Donald Trump bụ onyeisiala mba Amerịka ekwuola sị na mba ya na-ede ọdọ iri ise na abụọ dị na mba Ịran ha ga-ebu ọgụ agakwu ma ọ bụrụ na Tehran buru ụzọ wakpoo ndị Amerịka. Trump kwuru na Amerịka achọghị mmaja ọzọ sitere n'aka ndị Ịran, ma ọ bụghị ya, ha agaghị egbu oge iwakpo ha ebe ọ ga-eru ha n'ọkpụkpụ. Chelsea na Nottingham Forest ga-akwata ya na Stamford Bridge taa, ịmata onye ga-agafe na onye ga-efere asọmpi FA aka, dịka a na-akwado ibanye agba nke anọ. Ihe nkiri a ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50997776 +health Coronavirus: Akụkọ ụgha gbasara nje a i kwesiri ịgbachi nkịtị "Coronavirus na-efesa mba ụwa niile mana o nwebeghi ọgwụgwọ ewepụtara maka ya. N'agbanyeghị nke a, ndị aghụghọ amalitela ịwepụta akụkọ ndị abụghị eziokwu gbasara ọgwụgwọ ya. Anyị elebaala anya n'ụfọdụ ụdịrị akụkọ ụgha a nakwa nke bụ eziokwu na ya. Ụfọdụ mmadụ ekwuola na ị ri Garlic ga-enye aka n'igbochi ọrịa a. Mana ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa niile bụ ""World Health Organisation"" (WHO) n'aha ịchafụ ekwuola na o nweghi ihe akaebe gosiri na Garlic na-agwọ ọrịa ahụ. Otu ụlọ ntaakụkọ na Chaịna biputere akụkọ otu nwaanyị gara ụlọọgwụ maka akpịrị ya n'ihi na o riri ihe ruru otu kg Garlic. O nwere akụkọ dị iche iche na-efegharị maka etu mkpomọkụ na ihe ndị dị ọkụ si egbu ọrịa ahụ. Otu n'ime ha ekesara n'ọtụtụ mba na-ekwu na ịṅụ mmiri ọkụ nakwa ịnọ n'ime anwụ na-egbu ọrịa ahụ Ha kwukwara na okwu ụgha ahụ si n'aka Unicef na-ahụ maka ọdịnma ụmụaka nke ha pụtara gọọ. Ọkammụta Bloomfield kwuru na ọ bụrụ na ịbu nje ahụ, ọ dịrị ahụ gị ịji aka ya wepu ya. ""Ọ dị mma iji mmiri ọkụ asụ akwa gị mana ọ dịghị mma ịji ya saa ahụ gị"" ka o kwukwara. Akụkọ ụgha ọzọ na-efegharị na-akọwa na ndị agbụrụ ojii, ọ kachasị n'Afrịka anaghị ebute ọrịa ahụ. Mana kemgbe akụkọ ahụ pụtara, ụfọdụ ndị ojii a ma ama ebutela ọrịa ahụ. Ha gụnyere Idris Elba na-eme ihe onyonyo, Blaise Matuidi nakwa King Paul Akpan Udoh bụ ndị ọgba bọọlụ. O nwere akụkọ ekesara na Facebook kwuru na ""otu dọkịta Japan"" kwuru na ịṅụ mmiri kwa nke iri na ise ga-asachapụ nje ọrịa ahụ bara ọṅụ. Ọkammụta Trudie Lang kwuru na o nweghi ọrị ahụ ọbụla gosiri na ị ga-ejinwu mmiri sachapụ nje n'ime ahụ gị. Nje ndị yiri Coronavirus na-abanye n'akụkụ ebe mmadụ si ekuru ume nke mere na mmiri agaghị asapụ ya. N'agbanyeghị nke a, o kwuru na mmiri ọṅụṅụ na-adị mma n'ahụ. Kemgbe ọrịa Coronavirus malitere, ọṅụ ihe ịkwọ aka bụ ""Hand Sanitizer"" arịala elu nke ukwu. Nke a mere na ọtụtụ ndị mmadụ bidoro ịdepụta ụzọ ị ga-esi mepụta ""Hand Sanitizer"" nke gị na be gị. Mana ndị ọrụ sayensị kwuru na ihe ndị a adịghị mma n'elu ahụ n'ihi na Sanitizer na-enwe ihe dị n'ime ya ga-eme ka ọ ghara ịmerụ mmadụ ahụ. Ọkammụta Bloomfield kwukwara na o kwenyeghị na ndị mmadụ nwereike ị rụpụta Santizer ga-edebe aka mmadụ ọcha n'ụlọ ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51943631 +business 'Ọsọ ahịa enyela m ego mana lee ihe mere m gaghị ekwe ka nwa m mee ya' Ị nụtụla maka ịgba ọsọ ahịa? Ị mara ihe ọ pụtara? Chima na-agba ọsọ ahịa n'Enugu akọwala ihe mere o ji ka na-eme ya ka afọ isii gachara agbanyeghị na ọ gaghị ekwe ka nwa ya ọbụla gbaa ọsọ ahịa. Ọ kwuputekwara uru na ọghọm dị na ya bụ ọsọ ahịa. Nnamdi Agbanelo mere akụkọ a Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/56798670 +health WHO ekwuola na ịrụte ọrụ aka na-edula mmadụ 745,000 mmụọ kwa afọ dịka nchọpụta gosiri "Ịrụte ọrụ aka na-egbu puku kwuru puku mmadụ kwa afọ, dịka ngalaba ahụike mbaụwa bụ ""World Health Organization"" (WHO) si kwuo. Nchọpụta mbụ a na-eme n'ụwa gbasara ya gosiri na mmadụ 745,000 nwụrụ n'afọ 2016 site n'ọrịa mkpọnwụahụ nakwa ọrịa obi nke ịrụ ọrụ ọtụtụ awa butere. Nchọpụta a gosiri na ihe a kacha emetụta ndị mmadụ bi na mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ Eshia nakwa Ndịda-Anyanwụ Pasifik. WHO kwuru na ihe a nwereike ịkawanye njọ n'ihi mkpamkpa coronavirus. Nchọpụta a e mere gosiri na ịrụ ọrụ ihe ruru awa 55 maọbụ karịa n'otu izu butere mmadụ iji pasentị 35 (35%) nwee ike ibute ọrịa mkpọnwụ ahụ, ma jirikwa pasentị 17 (17%) nwee ike ime ka mmadụ si n'ọrịa obi nwụọ. Nke a bụ iji tụnyere ịrụ ọrụ awa 35 ruo 40 n'otu izu. Nchọpụta a nke ngalaba International Labour Organization (ILO) so mee, gosikwara na ihe ruru atọ n'ime anọ bụ mmadụ ole nwụrụ n'ihi ịrụ ọrụ ọtụtụ awa bụ ụmụnwoke katatụrụla ahụ maọbụ ndị merela okenye. Ọtụtụ mgbe, ọnwụ ndị a na-abịa mgbe onye ahụ bitetụrụla ndụ, ụfọdụ oge mgbe ọtụtụ afọ gachara, karịa mgbe onye ahụ rụrụ ọrụ ọtụtụ afọ ahụ. Akụkọ ga-amasị gị... Dịka nchọpụta a agụnyeghi oge mkpamkpa ọrịa coronavirus a, ndị ọrụ WHO kwuru na etu ọtụtụ ndị mmadụ si malite ịrụ ọrụ n'ebe ọbụla ha nọ karịa ịbata n'ụlọọrụ nakwa ndakpọ akụnaụba, nwereike iso n'etu ihe ize ndụ ịrụte ọrụ aka si arị elu. ""Anyị nwere ihe mgbaama gosiri na mgbe mba dị iche iche banyere na mgbachi obodo, awa ole e ji arụ ọrụ ji ihe ruru pasentị iri (10%) rịgoo,"" ka Frank Pega bụ onye ọrụ WHO kwuru. Nchọpụta ahụ kwuru na ịrụ ọrụ ọtụtụ awa so bute ụfọdụ nrịanrịa si n'ịrụ ọrụ, nke mere ya nsogbu ọrịa si n'ọrụ kacha. WHO na-atụ atụmatụ ka ndị isi ụlọọrụ buru nke a n'uche mgbe ha na-enyocha ihe ndị nwereike ibutere ndị na-arụrụ ha ọrụ nsogbu ahụike. Pega kwuru sị na ikwu sị na 'ihe a bụ awa ole onye ga na-arụ' ga-abara ndị ọrụ uru dịka a hụrụ na ọ na-akwalite ntinye uchu n'ọrụ. ""Ọ bụ atụmatụ gosiri amamihe na ebulighi awa ole mmadụ ji arụ ọrụ n'oge akụnaụba ọtụtụ mba dị na nsogbu.""" https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-57138135 +politics Nnamdi Kanu update: Ihe ndị Nnamdi Kanu gwara m gwa ndị na-eso ya dịka m gara zute ya na Dec 30 - Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor "Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor agbaala ama na obi adịghị onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu mma n'ihi tigbuo zọgbuo na-akpọtụ n'ala Igbo. N'ozi o wepụtara dịka ọ gachara hụ Kanu ụbọchị Tọzde, abalị 30 nke ọnwa Disemba afọ 2021, o kwuru na Kanu rịọrọ ndị na-eso ya ka ha chọọ udo ma na-eme ihe iwu kwuru, ghara inye otu udo ha aha ọjọọ. O kwuru na Kanu rụtụrụ aka ihe mere n'Imo steeti na nsonso a, na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị omekome ka aka ha dị n'ihe na-akpọtụ n'ala Igbo, ma kwuo na ya abụọla ndị na-eme ihe ndị a ọnụ. ""Obi adịghị Onyendu mma maka mkpamkpa otu ndị omekome na-akpa n'ala nna anyị."" ""Ndị otu ọjọọ bụ ndị arụrụala chọrọ inye otu udo anyị aha ọjọọ. ""O nwere ndị otu ọjọọ na-arụrụ ọrụ. Onyendu kwuru na ya abụọla ha ọnụ."" Ejiofor kwukwara na Kanu dọrọ ndị otu ya aka na ntị ka ha kwụsị ịgbasa akụkọ ụgha. ""Ha esila n'ịgbasa akụkọ ụgha, na-abanyere ndị iro aja n'ukwu."" O kwuru na ọ ""hụrụ etu akụkọ ụgha a ma ama agbasa si edughie ndị amaghị, wee na-ebute ọgbaghara."" O kwuru na Kanu gara n'ihu kelee ndị na-eso ya maka nkwado ha na-enye ya ma kwuo na afọ ọhụrụ ga-eweta ihe ọma. Cheta na nsonso a Ejofor gara zute Kanu, okwu ebubo na ndị DSS na-emekpa Nnamdi Kanu, na agụgọ ndị uweojii nzuzo bụ isi okwu. DSS na-agọ na ha anaghị emekpa Nnamdi Kanu ahụ nke Ejiofor kwuru na ọ bụ okwu bụ meremere n'ihu, gwọmpịtị n'azụ. Ejiofor kwuru na ewezuga ndị ọkaiwu ya na ndị garala hụ ya, na ndị DSS anaghị ekwe Kanu hụ mmadụ. Ejiofor kwuru na ha anaghị ekwe ka o nwee mgbanwe akwa. Nke a bụ n'agbanyeghị na ọnụ na-ekwuru ndị DSS bụ Peter Afunanya kwuru na Kanu enweghị mmekpa ahụ ọbụla na mkpọrọ ha, na ọ na-agbanwe akwa ya kwa ụbọchị. O kwuru na ""nnukwu ụkọchukwu Bishop Sunday Onuoha ga-agba akaebe na ugboro abụọ ọ bịara hụ Nnamdi Kanu n'ogige DSS, ọ bụ otu akwa o yi kemgbe ọnwa Juun ka ọ ka yi ruo taa."" Ọ bụ naanị akwa Fendi o yi mgbe a tọọrọ ya na Kenya bụ akwa o yiri bịa n'ụlọikpe, nke ọha ndị mmadụ ga-agba akaebe nke a n'agbanyeghị arịrịọ niile anyị rịọla ndị ọdị n'aka.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-59838221 +business Border Closure: 'Enweghị ibu ga-esi n'oke ala Naijirịa gafee maọbụ bata' - Hameed Ali "Ngalaba gọọmentị a kpọrọ ""Ex-Swift Response"" nke mejuputara ngalaba na-ahụ maka nchekwa oke ala bụ (Nigeria Customs Service) na ndị na-ahụ maka nkwabata na nkwapụ (Nigeria Immigration Service, ekwuola na ha agaghị agbape oke Naijirịa tupu ndị mba ha na Naijirịa gbara oke emee ka ha sị kwekọrịta. Ọ bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka nchekwa oke (Customs) bụ Hameed Ali kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakụkọ zutere. Ali kwuru na naanị ihe ha chọrọ bụ ka mba ndị a bido ime ihe ha na Naijirịa kwekọrịtara maka ngafe ibu mgbe Olusegun Obasanjo bụ onyeisiala. O kwuru na mgbachi oke ala Naijirịa eritela erere ihe ruru otu ijeri naira na ọma anọ (1.4 billion) sitere na mmachi osikapa na ahịa iwu ndị ọzọ. Hameed Ali kọwakwara na mba Nijee ebidola ime ka ha siri kwekorịta site n'ịmachi ibubata osikapa na Naijirịa. N'aka nke ọzọ, onyeisi ngalaba na-ahụ maka nkwabata na nkwapụ bụ Muhammed Babandede kwukwara na ha anwụchiela ụfọdụ ndị mmadụ n'oke ala Naijirịa. O kwukwara na onye na-enweghị akwụkwọ njem agaghị agafe oke Naijirịa. Babandede kwuru na ha gbochiri ndị Naijirịa otu nari na iri ise (150) ịhapụ Naijiria makana akwụkwọ ha ezighị ezi, gbochie ndị mmadụ otu puku na otu narị na iri na ọtụ (1,111) ịbata maka akwụkwọ ezighi ezi. O kwukwara na ha ejidela ma chụghachị mmadụ narị asaa na iri abụo na asatọ (728) makana ha enweghi akwụkwọ ziri ezi ma nọrọ na Naijiria. Ọ gara n'ihu kwuo na ha nwụchikwara ndị Pakistan na Nọt Koriya na-esighi n'oke ECOWAS, chụghachị ha ma machie ha ịbata Naijiria ebighebi." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50045980 +politics Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Kim Yong-Chol abatala Amerịka Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Anwụchịrị ndị chọrọ ime ngagharị iwe n'Enugu Ndị uweojii anwụchiela mmadụ iri abụọ ha kpọrọ ndị otu Biafra Zionists Federation, gụnyere onye isi ha a na-akpọ ọkaiwu Benjamin onwuka n'Enugwu ụnyaahụ. Ha nwụchiri ndị a mgbe ha chọrọ iji aka ike banye n'ogige ụlọ gọọmentị Enugwu Ndị EFCC anwụchiela Alhaji Ramalan Yero wụbụ gọvanọ ndị Kaduna, Abubakar Gaya-Haruna bụbu onyeisioche ndị PDP, Hamza Ishaq bụbu odeakwụkwọ gọọmentị Kaduna nakwa Nuhu Somo bụbu minista. A nwụchiri ha maka ebubo mmerụaka gbasara nde Naịra narị asaa na iri ise so n'ego ndị PDP ji mee mgbasaozi na ndọrọndọrọ ọchịchị 2015. Aka Ikenga Kim Jong-Un bụ onyeisiala mba North Korea na Mike Pompeo bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta Amerịka na mba ofesi, ezukọọla na New York. Ọbịbịa Kim Yong-Chol ga-eme ya mbụ onye ọkwa ya gbagotere na North Korea ga-abịa Amerịka n'ime ihe ruru afọ iri abụọ. Onye nchịkọta ndị otu Super Eagles bụ Gernot Rohr kwuru na Ikeme nwere ike iso ha aga iko mbaụwa na Rọshịa ma bụrụkwa onye otu ha a na-akwanyere ugwu. Cheta na a chọtara ọrịa Leukaemia n'ahụ Ikeme bụ aka na-echere Naịjirịa goolu, n'afọ gara aga. Ihe nkiri nke taa: https://www.bbc.com/igbo/afirika-44313465 +entertainment Patrick Chuka na-eji mkpịsị odee ese ihe akọwaala etu o si malite Patrick Chuka bụ nwaamadị na-eji mkpịsị odee ese ihe. Chuka dị afọ 20 gwara BBC Igbo na ọ bụ ya ji aka ya kuziere onwe ya etu e si eji mkpịsị odee ese ihe. Chuka bi na mba Amerịka ugbua, kwukwara na ise ihe bụ akaraka ya. O kwuru na otu ihe na-enyetu ya nsogbu n'ọrụ a, bụ ịhụ ndị ga-agba ya aka ahịa. Mana nke a egbochighi ya inye ndị ntorobia ibe ya na-eme nka ndụmọdụ, ebe ọ gwara ha ka ha gbasie mbọ ike ma na-achụsi nrọ ha ike. Gere ihe o kwuru n'uju: Ndị mere akụkọ a bụ Chiagozie Nwonwu na Chiemela Peter Mgbeahuru https://www.bbc.com/igbo/media-54739824 +entertainment Idinotu kachasị dị ndị Igbo mkpa n'oge dị otu a - Jennifer Eliogu "Jennifer Eliogu bụ onye ejije Nollywood a ma ama. Ya na BBC nwere mkparịtaụka ebe o kwuru maka etu o si malite iti egwu. Ọ kọwara na ọ banyere iti egwu n'afọ 2012. Ihe ndị ọzọ o tinyere ọnụ na ya gụnyere ezinaụlọ ya, ọnọdụ nchekwa ala Igbo nakwa ọnọdụ Naijiria ugbua. O kwukwara ihe mere o ji gụọ egwu ya wuru nsonso a bụ ""ọnụrụ ube nwanne"". Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:" https://www.bbc.com/igbo/articles/cqvl3xe47epo +sports Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: 'Super Falconets' agaala iko mbaụwa ụmụnwaanyị taa Akụkọ dị mkpa Onyeisioche otu APC bụ Adams Oshiomhole agwaala onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki ya si n'ọkwa ya ritue. Oshiomhole gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ugwu kwesiri ekwesi dịka ya, onyeisiala Muhammadu Buhari na ụfọdụ ndị sinetọ APC gbachara izu ụnyaahụ na. Ihe ọzọ pụtara na nzụkọ ahụ bụ na aka na-achị Imo steeti bụ Owelle Rochas Okorocha kwuru na ọ nweghi onye ọzọ ga-ahapụ pati ha. O kwuru na ha bubu n'uche na ndị ahụ gafere n'otu PDP na ndị ọzọ ga-apụ. Na mba ofesi, Otu chikọtara mba uwa niile bụ UN nakwa mba Briten arịọla ka ndị agha jiri nwaanyọ sobe ndị na-eme ngagharị iwe ntuliaka na mba Zimbabwe. Cheta na ọgbaaghara dara na ntuliaka emere na Zimbabwe ụnya ahụ tara isi mmadụ atọ. N'egwuregwu, Otu egwuregwu bọọlụ nke ụmụnwaanyị Naịjirịa bu Falconets ga-aga mba France taa nke a bụ maka njem ị bụlata iko mba ụwa ụmụnwaanyị na-ebido na France n'ụbọchị ise nke ọnwa ọgọst. Lee nkeji nke ụtụtụ a https://www.bbc.com/igbo/afirika-45041658 +entertainment Imo state Tourism: Lee Oguta, obodo ọma nọ n'akụkụ mmiri Ihe nkiri a na-egosi obodo Oguta (Ugwuta) bụ ebe Charly Boy, nna ya bụ Ọkaikpe Oputa, Flora Nwapa, Francis Arthur Nzeribe nakwa ọtụtụ ndị ọzọ si. Mmiri Ugwuta sokwa na nke kachasị buo ibu n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Ugwuta so n'obodo kachasi mma n'Imo steeti, nke mere na ọ bụ ebe gọọmentị steetị ahụ jiri chọọ ime ebe nlegharị anya. Ndị mere ihe nkiri a bụ Chris Okereke na Chimamaka Ihenacho Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50612731 +business Chinmark investment: Ihe i nwere ike ime iji nweta ego i tinyere n''investment' akụkọ bara - Johnson Chukwu Ndị igbo si na mmadụ agaghị anọ na mmiri ma ncha abanye ya n’anya, ya mere BBC Igbo ji gba mbọ wetere ndị mmadụ ihe ha kwesiri ima maka itinye ego n'ụlọọrụ ndị 'investment'. Dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ egwu ugbua banyere ụlọọrụ azụmahịa nakwa nke ndị na-eji ego achụ ego ma na-ekwe nkwa ha anaghị emezu, lee ihe otu nwoke aha ya bụ Johnson Chukwu bụ onye ọkacha mara n’ihe gbasara ego na azụmahịa kwuru maka etu mmadụ ga-esi mara ụlọọrụ ego bụ nke ọma na nke bụ nke aghụghọ. Ọtụtụ ndị mmadụ abanyela n'ụgbọ bufere ha site n'ụzọ ụlọọrụ ndị 'investment' maọbụ ụzọ ụlọọrụ isusu nke aghụghọ dị ịcheịche. Otu n’ime ha wuru ewu bụ MMM nke gọọmentị Naịjirịa dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara itinye ego ha n’ime ya mana ọtụtụ egeghị ya bụ ndụmọdụ ntị. Ụlọọrụ MMM mechara kụsasịa ma buru ego ndị mmadụ gba ọsọ n’afọ 2019. Ụjọ ji ndị mmadụ ugbua ọkachasị dịka akụkọ otu ụlọọrụ akpọrọ Chinmark Group pụtara ihe ebe ọtụtụ na-ebo ha ebubo na ha nakọtara ndị mmadụ ego ma ghara ịkwụchị ha ya dịka ha si kwee na nkwa. Dịka a ka na-enyo okwu ụlọọrụ a enyo, kirie ihe onyonyo a ka ị hụrụ ihe onye ọkacha mara kwuru banyere itinye ego n’ụlọọrụ ndị na-eji ego achụ ego site n’ụzọ Bekee kpọrọ ‘investment’. Akụkọ ndị yitere nke a: https://www.bbc.com/igbo/60867896 +business Marksman Chinedu Ijiomah: Ejịghị m ego ndị mmadụ mee 'dorime' "Onyeisi ụlọọrụ Chinmark Group bụ Marksman Chinedu Ijiomah ekwuola na ihe mere ya ji ghara imezu nkwa ịkwụ ndị tinyere ego n'ụlọọrụ ya bụ n'ihi na ngalaba na-ahụ maka itinye ego n'azụmahịa a kpọrọ Security Exchange Commission(Sec) natara ikike gbachie akpaego ya na nke ụlọrụ ya dị n'ụlọakụ. Chinmark na Chinedu Ijiomah na-ewu kemgbe na soshal midia maka etu ndị mmadụ si pụta na-ekwu na o kweghị akwụ ha ụgwọ o ji ha dịka ụfọdụ n'ime ha tinyere ego ha n'ụlọahịa ya iji nweta isi ego na ọmụrụnwa. Ọtụtụ ndị a na-eti mkpu ego ha kwuru na mbọ niile ha gbarala maka nke a dara mmiri dịka Ijiomah gbachiri ekwentị ya ma were ndị agbero wujuo n'ụlọọrụ ya dịga na mpaghara di iche iche na Naijiria nakwa na Dubai. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Ijiomah kwuru na ọ bụghị ọsọ ka ya gbara kama na SEC gbachiri akpaego ya, nke nwunye ya na nwa ya. O kwuru na o nweela ndị ya kwụrụ ụgwọ n'ime ihe ruru mmadụ 400 tinyere ego n'ụlọahịa ya. ma kwekwa nkwa na ya ga-anwụ ndị fọrọ afọ ma ọ bụrụ na ha nye ya ohere ọnwa asaa na-abịa. Ngalaba Securities & Exchange Commission (SEC) nke Naịjirịa depụtara n'ọba ozi webụsaiti ha akwụkwọ ozi katọrọ atụmaatụ oji ego achụ ego nke ụlọahịa Chinmark Group. Akwụkwọ ozi ahụ bu deeti December 25, 2021 dọrọ ndị mmadụ aka na nti ka ha mata na Chinmark group nke nọ n'okpuru aha Fin Africa Investment Limited edenyeghị aha azụmahia ya n'akwụkwọ SEC ma na-ekwu na onye ọbụla ya na ha na-emekọ ihe, ihe ọ hụru ya jiri isi ya buru. Ụlọọrụ Chinmark Group dịka ha siri kọwa na websaiti ha bụ ụlọọrụ nwere ọtụtụ alaka nke gụnyere ewumewu ụlọ (Chinmark Homes and Shelter) ọrụugbo ( Chinmark Farms, njem (Chinmark Rides), erimeri(Chinmark Restaurant & Foods services) wdgz. Isiụlọọrụ ahụ dị na 162 Ogui Road, Enugwu. Udiri ihe a ometụla mbụ na Naịjiria? Ihe na-eme n'ụlọ ọrụ Chinmark ugbua yitere atụmaatụ MMM nke a na-akpọ ""Mavrodi Mundial Moneybox"" na bekee. Ndị nwe atụmaatụ a kwuru na ha ji ya enyere ndị mmadụ aka mana ụlọakụ ukwu (Central Bank of Nigeria) gọọmenti Naịjirịa dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha gbara ya bụ atụmaatụ ọsọ. N'ọnwa Aprelu nke afọ 2018 ka ndị nwe ya bụ atụmaatụ gwara ndị mmadụ na ha gbachiri ọnụ ụzọ ha maka onyeisi ha bụ Sergie Mavrodi anwụọla. Ọtụtụ ndị mmadụ si mba Ghana, Kenya nakwa Naijirịa tufuru ọtụtụ ego mgbe aka bidoro gbajiwe atụmaatụ a n'afọ 2016." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60881851 +politics Gọọmentị Naijịrịa agwala onye nnọchite anya ya na mba Indonesia ya lọghachị mba Naijịrịa "Naịjirịa akpọghachitala onye nnọchite anya ha na Indonesia bụ onye ndị ọrụ nchekwa na ahụ maka ndị njem nyụrụ ịkpakwụ ụnyaahụ. Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ nchekwa mba Indonesia mekpara ya bụ nwoke nnọchịte anya ahụ na mba ha. N'ime ihe onyonyo na-efeghari na soshal midia e gorosiri ka ndị ọrụ nchekwa na ahụ maka ndị na-eme njem (Immigration services) biri ya bụ nwoke aka ọjọọ aka ozuru ohi. Gọọmentị etiti akatọọla ihe a mere, ma kwuo ka ndị ọrụ na ahụ maka mmekọrịta mba na mba tinye anya na ya bụ okwu ma hụ na a tara mba Indonesia ahụhụ maka agwa a. Akụkọ na-ekwu ugbua na ya bụ nwoke emeruru ahụ na-arụ n'ụlọọrụ Nigerian High Commission. E kwuru na ka ihe si mee bụ na ndị ọrụ nchekwa bịagịdere nwoke a n'ike, ebe ọ gara ịzụ ihe n'ahia nke dị na isi obodo mba ahụ bụ Jakarta. Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta ala Naijịrịa na mba ndị ọzọ bụ Geoffery Onyeama kwuru n'ozi ya na agwa a megidere iwu nwekọrịta mba ahụ na mba ndị ọzọ. N'ụbọchị Mọnde ka a gwara ya bụ nwoke kwara ngwo ngwo ya lọghachịte Naijịria. Gọọmentị mba ahụ ezipụtala ozi arịrịọ maka ihe a mere. Onyeama kwuru na ozi ya taa bụ Tuzde sị, ""anyị amalitela ọrụ nyocha pụrụiche n'akụkọ ihe a mere, anyị ga-ekwupụta mkpebi anyị n'okwu na nso nso a"". O kwuru si, ""mkpesa anyị bụ ka gọọmentị mba Indonesia taa ndị mere ihe ọjọọ a ezigbo ahụhụ diri ha, maka agwa a ha kpara ezighi ezi"" ""O nweghi ihe kwesiri ikpalite ime onye obia etu a ndị a si mee, ọkachasi onye nnọchite Naijịrịa."" O kwuru na ihe bụ agwa ọjọọ a na-ekwesighi inabata cha cha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58166929 +entertainment Chiamaonwu Joy: Eji m eserese m mụtara na YouTube egosipụta omenala Igbo Chiamaonwu Joy na-ese ụdị eserese a na-akpọ 'hyper realistic drawing'. Ọ kọwala ihe omimi dị n'ụdị ihe ọ na-ese. Ọ sị na ọ malitere ise ihe mgbe ọ dị naanị afọ isii, na o nweghi ụlọakwụkwọ ọ gara mụta ya kama na ọ bụ n'ịntanet. Nwada a sị na ọ bụ onye na-ese ihe banyere ọdịnala nke ọ na-eji egosipụta ọtụtụ ihe omimi dị n'omenala Igbo. Chiamaonwu sị njirimara ihe osise ya bụ okpokoro ejula nke mere o ji pụọ iche na ndị ọzọ. Ọ sị ihe mere o ji eji okpokoro ejula bụ maka na ọ bụ otu n'ime ihe ndị dibia ji agba afa. Kirie ihe o kwuru n'uju. Onye mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka https://www.bbc.com/igbo/afirika-53410811 +sports Newcastle vs Man United: E chiela Man United 'E cheta ebewe nke mbụ n'Ịngland' 'Aga m akọrọ onye akwa ụwa m' bụ akwa Manchester United bere mgbe Newcastle United meriri ha n'asọmpi Premier League. Mmeri a bụ ihe mgbawa obi nye Man United n'ihi otu goolu Newcatle nyere ha bịara na ngwụcha oge. Otu egwuregwu bọọlụ abụọ ndị a foro ntụtụ taa n'ime ọkara mbụ n'asọmpi ahụ. Mana goolu a si n'aka Mathew Longstaff dị afọ iri na itoolu nke Newcatle bịara na nkeji 72 n'ime ọkara abụọ. Man United siri ọnwụ etu ha nwere ike iji mere onwe ha aha mana Newcastle kwechiri ruo ngwụcha asọmpi. Nke a na-abụ ugboro atọ a na-emeri Manchester United n'afọ 2019 banye 2020 na Premier League. Otu ọkpụ goolu a e ji merie Man United dosara ha n'ogogo iri na abụọ na tebụlụ asọmpi Premier League. Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49954271 +sports Nigeria vs Madagascar: NFF ji anyị ụgwọ mana ọgaghị egbochi anyị ịnwa ike anyi - Ahmed Musa "Osote onyendu ndị otu bọọlụ Super Eagles bụ Ahmed Musa ekwuola na nlekọta egwuregwu bọọlụ Naijiria bụ NFF ka ji ha ụgwọ asọmpị ha gbagoro agba. Musa kwuru nke a taa na mkparịta ụka ha na ndị ntaakụkọ n'Alezandria, Ijipt. Ndị Super Eagles ga-ezute mba Madagaska n'ụbọchị ụka bụ abalị iri atọ nke ọnwa Juun 2019. Ha ji otu ọkpụ goolu merie mba Burundi nakwa Guinea mgbe ha zutere n'izu gara aga. Musa kwuru na ""ọjọgburu onwe ya na ndị nlekọta egwuregwu bọọlụ na Afrika ka na-eji ndị ọgba bọọlụ ụgwọ. ""O kwesịrị ka gọọmentị mba Afrika niile tinye aka iji kwụsị ụdị ihe ihere a. ""Mana nke a agaghị egbochi anyị ịnwa ike anyị iji buo Iko Mba Afrika nke afọ a."" Ndị Super Eagles chọbụrụ ịgba abụbụ ọrụ tupu asọmpị nke ha na Guinea n'ihi ụgwọ NFF ji ha, mana ha mechara kwụsị dịka onyendu ha bụ Mikel Obi rịọchara ha arịrịọ. Musa gakwara n'ihu kwuo na ihe mere o ji dịka ndị Super Eagles a na-agba ọnyụpa bụ maka oke ekpomọkụ dị na Ijipt ugbua. N'okwu nke ya, onye nlekọta ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr`sị na olileanya dị na ndị otu ya ga-eme ọfụma na asọmpi Afcon 2019. Okwukwara na a ga-ahụ mgbanwe na ndị ga-eso n'egwu mgbe ha ga-ezute Madagaska echi. Onye nlekọta otu egwu bọọlụ ndị Madagaska bụ Nicholas Dupuis kwuru na ndị otu ya nwekwara ike ime ihe ga-atụ ndị mmadụ n'anya mgbe ha ga-ezutere Naijiria echi na-agbanyeghi na ndị mmadụ na-elelị ha anya. Naijiria agafeelari n'agba nke abụọ nke asọmpi Afcon, mana ọdịkwa mkpa na ha ga-emeri echi iji tozuo oke dịka ndị mbụ na 'Group B' Asọmpi Naijiria na Madagaska ga-ebiri ọkụ n'elekere ise nke mgbede echi. BBC Igbo nọ chịm na mba Ijipt iwetara ụnụ etu ihe niile si aga. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48810711 +religion Fire Outbreak: Ọkụ agbagbuola Fada n'ụlọụka Katọlik Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ha na-enyocha ihe mere otu ụkọchukwu ọkụ gbagburu n'Nnewi, Anambra steeti. Ọk�� agbagbuola otụ ụkọchụkwụ Katọlịk a kpọrọ Fada Edmond Nwagbala n'ụlọụka St. Peters Claver Katọlik dị na Nnewi Ichi Uruagu dị n'Anambra Steeti. Ndị bi nso ebe ihe mere kwuru na ha n'ụlọ ha nụ ka ihe gbara ha gbapụta ị mara ihe dara ụdọ ahụ were hụ ọkụ na-agba n'ụlọ Fadaa ahụ 'ebe elekere mbụ nke isi ụtụtụ Satọdee. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Muhammed sị na ọkụ a malitere ịgba n'elekere anọ nke isi ụtụtụ 16 Nọvemba, 2019. Ọkụ a na-amabeghi ihe kpatara ya gbara ebe obibi ụlọụka ahụ bụ ebe Fada Edmund Nwagbala dị afọ iri isii bi ma gbaa ya nke a na-amaghị onye ọ bụ. Haruna sị na ndị ọrụ nchekwa uweojii ngalaba Otolo nakwa ndị na-agbanyụ ọkụ wụchiri ebe ahụ bịa gbayụọ ọkụ a. Ngwa ngwa ebu Fada Edmund gawa ụlọọgwụ mana e kwupụtara ọnwụ ya, e tinye zie ya n'ụlọozu maka nyocha. Ọ sị na kọmishona ndị uwojii n'Anambra bụ John B. Abang enyela iwu ka a malite nyocha tara ọchịchị banyere nke a. Ndị ntọrị tọrọ Fada Theophilus Ndulue, nke ụlọụka St. Patrick Katọlik Ihuonyia, Amansi-Odo, dị n'okpuruọchịchị Ezeagu n'Enugwu Steeti. Nke a mere na mgbede ụbọchị Fraịde 15 Nọvemba, 2019, Mgbe o si nzukọ ndị ụkọchukwu na-alọta. Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ụlọụka a bụ Fada Benjamin Achi mere ka a mata nke a. Ọ sị na a tọrọ Fada Theophilus na onyeisi ndị ụmụnwaanyị bụ ha mechara tọhapụ dịka otu awa gachara mana Fada a ka nọ n'aka ndị a. Ndị ntọrị a akpọbeghi ezinaụlọ Fada Theophilus maọbụ ndị isi ụlọụka maka ịjụ ajụjụ n'isi ya. Nke a ga-abụ ugboro ise ndị ntọrị na-atọrọ ndị ụkọchukwu Katọlik n'Enugwu Steeti. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50446451 +entertainment Chike Akunyili: Lee etu akwamozu di Dora Akunyili si aga Akwamozu di Dora Akunyili bụ Dkta Chike Akunyili na-aga n'ihu n'obodo ya bụ Agulu n'Anambara Steeti. Ọ bụ n'ụbọchị 28 nke ọnwa Sepụtemba ka ndị omekome ji egbe gbagburu Dkta Akunyili na onye uweojii nakwa onye enyemaka ya na Nkpor. Dkta Akunyili si emume ebe e nyere nwunye ya bụ Dora Akunyili nturuugo n'Ọnicha ala oge e gburu ya. A ga-eli ya na be ya n'Agulu ma e mechaa akwamozu ya. Lee foto ndị si n'emume ahụ pụta: https://www.bbc.com/igbo/afirika-59415408 +politics Akụkọ kachasị n'abalị a: Amnesty International arụọla gọọmentị Naịjirịa aka ọjọọ Akụkọ kachasị mkpa; Otu na-ahụ maka ugwu ruru onye bụ Amnesty International ebola gọọmenti Naịjirịa ebubo ịkwado ogbugbu ndị mmadụ bụ nke na-arị ibe ya elu ugbua na-ejideghị ndị ogbu mmadụ ahụ. Otu a kwuru na ọnụ ọgụgụ ndị egburula n'afọ 2018 akarịala nke ndị nke e gburu n'afọ 2017. Ndị mkpọrọ n'Enugwu abaala ụlọakwụkwọ mahadum Mmadụ iri atọ na asaa bụ ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ Enugu abaala ụlọakwụkwọ National Open Universịty nke Naịjirịa. Onye nchịkọta ụlọakwụkwọ a n'Enugwu bụ ọkanmụta Uche Onyia gwara ndị a na ụlọọrụ na-ahụ maka Mahadum enyela ha ikike ịgụ akwụkwọ. Agbagbuola onye ji aha pati Accord zọkwa Gọvanọ Akwa Ibom Steeti Ndị oji egbe agbagbuola onye jibu aha Accord Parti zọọ ọkwa Gọvanọ n'Akwa Ibom Steeti bụ Okon Iyanam n'ụlọ oriri ọhụrụ ya dị n'Ogun Steeti ụnyaahụ. Iyanam zọrọ ọkwa Gọvanọ Akwa Ibom Steeti n'afọ 2015 n'aha Pati Accord. Mba Senegal esorola ogbo ha ndị mba Afrịka ndị ọzọ kwakọrọ pụọ n'asọmpi Iko Mbaụwa nke pụtara na onweghị mba Afrịka ọbụla fọrọ n'asọmpi a. N'abalị a Jaapan ga-ezute Tunisịa ebe Ịngland ga-ezute Beljọm. Nkeji nke abalị a: https://www.bbc.com/igbo/afirika-44649859 +entertainment Yul-Edochie azaghachila ndị mmadụ maka nwaanyị abụọ ọ lụrụ "Onye ejije a ma ama bụ Yul Edochie apụtala kwuo okwu gbasara nwunye abụọ nke ọ lụrụ. N'ihe onyonyo o tinyere n'akara Facebook ya, ọ kwuru sị ""ọ bụ ndụ m, ọ sọ m alụọ m nwaanyị iri abụọ na ise maọbụ iri ise"". Ọ sị na o teela aka ndị mmadụ na-eji ya si ya gbachi nkịtị mana o gaghị agbachi nkịtị gbasara okwu a. Ike niile ndị mmadụ na-emefu n'ihe gbasara ya na ezinaụlọ ya bụ ihe mere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ejighi ha kpọrọ ihe. ""O nwere otu sị na ha ga-awụlite Naira n'ebe Dọlla dị mana ha emeghị nke a. unu ejirila ike a niile gwa ha okwu?"" ka o kwuru n'ịchafụ n'onyonyo ahụ. Dịka ọ na-akpọtụ na soshal midia na onye ihe ejije Nollywood bụ Yul Edochie alụọla nwaanyị nke abụọ, ajụjụ ọtụtụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ kedụ ebe Iwu Naijiria kwụ na okwu nwoke ịlụ nwaanyị ụbara. Ọkachamara n'okwu iwu Naijiria bụ Ọkaiwu Chima Nnaji kọwara BBC Igbo ebe iwu Naijiria kwụ n'okwu a gbadoro ụkwụ alumdinanwunye Yul na nwaanyị mbụ ya nwere. Cheta na n'abalị 27 nke ọnwa Eprelụ afọ 2022, Yul Edochie bụ onye kwupụtara na nsonso a na ya chọrọ ịzọ ọkwa onyeisisla, wepụtara foto agadaga nwanwoke were kwupụta na ya alụọla nne nwata ahụ dịka nwaanyị ya nke abụọ. Ọkaiwu Nnaji kọwara na ọ bụrụ na Yul lụrụ nwaanyị mbụ ya nanị n'iwu omenala, na nsogbu ọbụla adịghị ya. Mana ọ bụrụ na ka ha mechara nke omenala, ha lụrụ n'iwu Bekee, ịlụ nwaanyị nke abụọ ga-etinyeli na mkpọrọ n'ihi na ọ dara iwu Naijiria. ""N' alụmdi na nwunye na otu nwoke na otu nwaanyi na enweghị onye ọzọ. Onye lụrụ nwaanyị n'ụlọikpe agaghị alụ nwaanyị ọzọ."" ""Ọ gaa n'ụlọikpe kweta na ọ lụrụ nwaanyị nke abụo, ị mara na Igwe agaala nga."" N'aka, nke ọzọ, otu onye omenala Igbo were anya bụ Edy Nwangene Odenigbo kwuru na omenala Igbo nabatara nwoke ịlụ karịa otu nwaanyị n'ihi na ọ na-enyere ha aka n'ọrụugbo. Odenigbo,onye kwuru na-agbanyeghị na ya bụ onye omenala, na ya agaghị alụ karịa otu nwaanyị sịrị,""Omenala Igbo kwadoro nwoke ịlụ ụbara nwaanyị n'ihi na ọ na-enye ohere ịmụta ọtụtụ ụmụ."" ""Mgbe ochie, anyị na-arụ ọrụụgbo. Ndị nwere ọtụtụ nwaanyị na ọtụtụ ụmụ na-akpọ ha aga ọrụugbo."" Fada Cajetan Iyiobi kọwara n'iwu ụka Katolik megidere Nwaanyị ịlụ karịa otu nwaanyị. ""Ụka Katoliki anabaghị nwoke maọbụ nwaanyị ịlụ onye nke abụọ ma lụkwa onye ọzọ. ""Ọ bụrụ na o mee ya, a ga-ekewapụ ya, ọ kwụsị ịnata oriri dị asọ."" Iyiobi bụ ụkọchukwu na Nsuka Dayọsịs kọwara na 'adịghị agba alụkwaghịm n'ụka Katọlik kama e nwere ike kagburu alumdinanwunye mbụ ya bụ oge nwoke maọbụ nwaanyị inwe ohere ịlụ n onye ọzọ. Mana dịka Fada Iyiobi siri kọwaa ụka Katolik e nwere ike ime ka ịsị na ọgbamakwụkwọ mmadụ nwere adịghị ire ma ọ bụrụ na o nwere onye ghọgburu ibe ya na agbamokwukwo nke e mere eme. Iji maa atụ: 1. Ọ bụrụ na o nwere ọrịa nwoke maọbụ nwaanyị bu mana ọ gwaghị di ya maọbụ nwunye ya. 2. Ọ bụrụ na nwoke maọbụ nwaanyị sị na ya alụbeghị nwaanyị maọbụ di mbụ e mechaa a chọpụta na ọ lụọla Kemgbe ụbọchị 27 Eprel, 2022 akụkọ na onye ejije Nollywood Yul Edochie lụrụ nwaanyị nke abụọ a kpọrọ Judy Austin Muoghalu gbakapụtara, ịntaneti enwurula ọkụ. Ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ Yul sị na o metaghị ya, na-agbanyeghị na ọ pụtara ọzọ kwuo na ""ma e tere ogiri, e tere ụgba"" na nwunye ya nke mbụ bụ May Yul Edochie bụ isi nwaanyị. Mana ụfọdụ a ma ama dịka Tchidi Chikere na Ugezu Ugezu na-akwado ya. Tchidi Chikere na-ahazi ejije na Nollywood onye turu Yul ""Odogwu!"" katọrọ ndị na-ekwu ihe ọjọọ maka ihe Yul mere sị na ha bụ ndị ihu abụọ. ""Ọtụtụ ụmụnwoke na ụmụnwaanyị na-akatọ gị bụ ndị ihu abụọ. Ndị ihu abụọ juru ụwa."" Ugezu Ugezu kwuru na ọ na-agba ya gharịị ụmụnwaanyị ndị na-eso nwoke lụrụ nwaanyị ebe ọtụtụ ụmụnwaanyị na soshal midia na-akatọ nwoke ịlụ ọtụtụ nwaanyị. Mana ndị dịka Uche Maduagwu, Chizzy Alichi na Nkechi Blessing kwuru na Yul dawara ukwu. Maduagwu kwuru na Yul kwesịrị ịrịọ nwunye mbụ bụ onye o kwuru nọnyere ya oge ọ na-ata ahụhụ mgbaghara. Ọ sịrị, ""Ọ bụrụ na i nwere ike ime nwaanyị nọnyere gị ụdị ihe, kedụzi ihe ị ga-eme Naijjiria ma ọ bụrụ na a tụnyere gị dịka onyeisioche okpuru ọchịchị?"" N' otu aka ahụ, Chizzy Alichi na Nkechi Blessing bụkwa ndị ejije Nollywood kwuru na ""ịlụ otu nwaanyị kacha mma."" Yul Edochie na-eme ejije Nollywood depụtara n'akara soshal midia ya. Ọ depụtara ka ụwa bia hụrụ akataka nwa nwoke nwunye ya nke abụọ aha ya bụ Judy Austin mụrụ ya. O kwuru na aha nwa ahụ bụ STAR DIKE MUNACHIMSO YUL - EDOCHIE. N'ọnụ ya, ""oge eruola mgbe ụwa kwesiri ịmata nwa m nwoke, onye mụrụ ya bụ nwunye m nke abụọ bụ Judy Austin, @judyaustin1. Ahụrụ m nwa m nwoke n'anya etu m si hụ ụmụ m ndị ọzọ n'anya."" N'okpuru ihe ahụ Yul Edochie depụtara ka ahụrụ ebe nwunye ya bụ May Yul-Edochie dere na ""chukwu ga-ekpe Yul na Judy ikpe."" Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ bido kwuwe maka ihe a Yul Edochie depụtara. Yul Edochie bụ onye na-eme ejije Nollywood. Ọ bụ nwa Peter Edochie na-emekwa ejije Nollywood. Ọ bụ onye Nteje dỊ n'Anambra steeti. Yul na nwunye ya bụ May Edochie ji ụmụ anọ gụnyere otu nwaanyị na ụmụnwoke atọ. O kwuru na ọ lụrụ May mgbe ọ dị naanị afọ 22, n'ụbọchị 31 nke ọnwa Ọktoba afọ 2004. A mụrụ ya n'ụbọchị asaa nke ọnwa Jenụwarị afọ 1982. N'afọ 2017 ka Yul Edochie zọrọ ọkwa gọvanọ nke Anambra steeti n'okpuru pati Democratic Peoples Congress (DPC). May Edochie (aha nna ya bụ Aligwe) bụ nwunye Yul nke ọ lụrụ oge ọ ka bụ nwokorobịa na-etolite etolite (o kwuru na ha lụrụ mgbe ọ dị afọ iri abụọ na abụọ). May mụtara ụmụ anọ; otu nwa nwaanyị na nwa nwoke atọ. A mụrụ ya n'ụbọchị 16 nke ọnwa Septemba. Ọ gụrụ ""Computer Engineering"" na mahadum Enugu State University of Science and Technology (Esut). Ọtụtụ ndị ma ya na-ekwu na ọ bụ nwaanyị obi ọma, na ọ naghị enye maọbụ chọọ nsogbu. Ezigbo aha ya bụ Muoghalu Uchechukwu Judith. Ọ bụ onye ejije Nollywood, nke ya na Yul Edochie mekọrọla ejije mbụ. Ọ bụkwa onye mmepụta ejije nke Bekee kpọrọ producer; o mepụtala ejije a kpọrọ ""Native Girl"" nakwa ""Fear"". Ọ malitere ime ejije n'afọ 2013. Ọ bụ onye Anambara steeti. A mụrụ ya n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba. Ọ gara mahadum na Nnamdi Azikwe University, Awka. Na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Vanguard nwere n'afọ 2020, Judy kwuru sị na ọ naghị ""ahụ alụmdinanwunye dịka ihe mmadụ ji etozu oke""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61246707 +health Glaucoma: Ọrịa ọjọọ nwere ike ime ka anya pịa mmadụ n'otu ntabi anya "Ị ma na i nwere ike bilie n'ụra otu ụbọchị chọpụta na ị nakwaghị ahụ ụzọ? Ama m na ị ga-asị 'tụfiakwa', maọbụ 'Chineke ekwela', mana ọrịa Glaucoma maọbụ Cataract nwere ike ime ka ihe dị otu a mee. Ọbụrụ na anya mmadụ adịghị, ọchịchịrị ga-agbachi ahụ mmadụ niile, ụwa enwekwaghị ihe ọ ga na-atọ. Ya mere o ji dị mkpa ichekwa anya gị ma gbochie ọrịa Glaucoma nakwa Cataract, nke nnyocha gosiri na ọ bụ ha kacha ebutere ndị mmadụ ikpu isi n'ụwa niile. E nwere akwara si n'anya mmadụ gaa n'ụbụrụ isi; Bekee na-akpọ ya 'optic nerve'. Ọ bụrụ na ike gwụ akwara a, ọ gaghịkwa enwe ike iziga ozi iji mee ka ụbụrụ ghọta ihe mmadụ na-ahụ. Glaucoma bụ ọrịa na-emebi akwara 'optic nerve' ma mee ka mmadụ kpuo isi n'otu ntabi anya. Dọkịta anya aha ya bụ Ugochukwu Eze kọwara na ọ bụghị na ọrịa glaucoma na-abịa n'otu ntabi anya, kama ọ na-eji nwayọ nwayọ amalite, nke pụtara na mmadụ agaghị enwe ike ịchọpụta ruo mgbe ọ kawanyere njọ. Mana oge ahụ, ọ dịla njọ, onwekwaghị ihe mmadụ ọbụla nwere ike ime maka ya. Dọkịta Eze kwuru sị: ""Ọ bụrụ na a chọpụta glaucoma n'oge, anyị nwere ike inyere onye ahụ aka ka anya ya ghara ịkpọ kpam kpam."" ""Mana ọ bụrụ na ya bụ ọrịa apịala mmadụ anya, onweghị ihe mmadụ ọbụla nwere ike ime iji nyere onye ahụ aka."" Ihe gbara ọkpụrụkpụ i kwesịrị ịma maka Glaucoma: Cataract bụ ọrịa na-eme ka ihe dịka urukpu (cloud) kochie mkpụrụ anya mmadụ. Nnyocha gosiri na ọ bụ cataract kacha akpata mmadụ ikpu isi na Naịjirịa. Mana ndị ọkachamara na-eji ịwa anya (eye surgery) agwọta ọrịa cataract. Ọrịa a na-eji nwayọ amalite, ọgaghịkwa enye onye ahụ nsogbu ruo mgbe ọ kawanyere njọ. Ihe e ji amakarị ọrịa Cataract bụ mmadụ inwe nhịahụ ịgụpụta ihe edere n'akwụkwọ maọbụ ịhụ ụzọ nke ọma n'abalị. Mmadụ ịhụ ihe dịka ọ gbara abụọ bụkwa njirimara ya Ihe nwere ike ibute Cataract bụ: Mgbochi Cataract: Ọgwụgwọ Cataract:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-55556727 +business Ọgba mbọ: 'E si m n'ighe akara bụrụ 'Councilor' okpuruọchịchị Nnewi North' - Ugochinyere Eze "Agbanyeghị na Ugochinyere Eze, bụ nwaanyị na-eghe akara, abụrụla 'Councilor' n'okpuruọchịchị Nnewi North dị n'Anambra, ọ ka na-eghe akara ya. Ndị agbataobi ya na-etu ya ""Honourable na-eghe akara"" maka na Ugbochinyere na-apụta n'elekere isii nke ụtụtụ ghechaa ma ree akara ya tupu ọ gawa ịrụ ọrụ 'councilor' ya n'okpuruọchịchị Nnewi North n'elekere itoolu nke ụtụtụ kwa. Ugochinyere kọọrọ anyị etu ọkwa councilor si ruo ya aka n'ụzọ dị iriba ama. Gere ya n'uju n'ihe nkiri a." https://www.bbc.com/igbo/media-54589155 +business Ọkụ gbara n'ahịa Eke-Ukwu dị n'Afikpo agbawala ndị mmadụ aka Ngwongwo ndị mmadụ lara n'iyi dịka ọkụ gbara ahịa Eke-Ukwu dị n'okpuruọchịchị Afikpo, Ebonyi steeti. Ya bụ ọkụ gbara n'abalị Tuzde, 12 nke ọnwa Julaị afọ 2022, repịara ụfọdụ akụkụ ahịa ahụ ma maebie ngwongwo ndị mmadụ. Enweghi onye nwụrụ maọbụ merụọ ahụ na ya bụ ọkụ ọgbụgba, dịka ndị hụrụ ka ihe mere si kwuo. Amabeghi ihe kpatara ya bụ ọkụ gbapịara ngwaahịa ndị mmadụ. Mbọ ụfọdụ ndị gbara ịzọpụta ụfọdụ ngwaahịa ndị mmadụ lara n'efu dịka ya bụ ọkụ ji ike na-agba. Oby Oko Enyim bụ onyeisi okpuruọchịchị ahụ, tiri ndị ọkụ a metụtara aka n'obi mgbe ọ garuru ebe ahụ, ma kwe ha nkwa na gọọmentị ga-agba mbọ ịgbatara ha ọsọ enyemaka. Omezue Johnson Inya Oka bụ onyeisi otu jikọrọ ndị ahịa Afikpo, Afikpo Market Traders Association (AMATA), kpọkuru gọọmenti ka ha gbaa mbọ hụ na ụdịrị ọdachi a emeghi ọzọ, site n'itinye ihe ndị e ji alụso ọkụ ọgụ. https://www.bbc.com/igbo/articles/cmje6pz5vljo +health Dementia: Kedụ ihe mere ọrịa a ji akawanye njọ ugbua? "Dementia bụ otu n'ime ọrịa na-emetụta ụbụrụ ndị mmadụ nke na-eme ka ha chezọọ ihe mere nsoso a. Dịka ngalaba WHO si kwuo, ihe karịrị mmadụ nde ise na ụma ise bụ ndị bu ọrịa ahụ ma kwuo na ọnụọgụgụ a nwereike iji ugboro atọ rịa elu n'afọ ole na ole na-abịa. Mgbe achọpụtara ọrịa a n'afọ 1908, ọbụghị ọrịa na-emetụta mmadụ niile mana ugbua otu onye na-ebute ya kwa ntabi anya atọ Mana n'agbanyeghị nke a, naanị otu mba n'ime mba anọ nwere iwu na-enyere ndị na-agabiga ọrịa a aka. Ọrịa Dementia bụ ọrịa na-emetụta akụkụ ụbụrụ akpọrọ 'Hippocampus' nke bụ ụzọ e si abanye ihe jikọrọ echiche. Seheli Jahan bụ onyeisi ọgwụ ụbụrụ n'ụlọọgwụ Bangladesh kwuru na ọ bụ 'ọrịa nchefu ihe' na nkenke. Ọ kọwara na ọ na-ara ahụ ka onye bu ọrịa dementia cheta ihe mere nsonso a mana ha na-enwe ike ịcheta ihe mere n'oge gara aga. ""Ọ na-aka mma na ndị bụ ntorobịa n'ihi na hippocampus' ka nwere ahụike, ọ na-akpọ nkụ ka mmadụ na-aka nka"" E nwere udiri ọrịa anọ bụ vascular dementia, Alzheimers dementia, live body dementia, frontal temporal dementia nakwa Parkinson's dementia. Ọ bụ ọrịa Alzheimers dementia bụ nke kachasị emetụta ndị mmadụ. Mgbanwe omume bụ ihe mbụ e ji achọpụta ndị nwere Dementia. Ihe ọzọ bụ nchefu ihe mere nsonso a, nchefu aha ha nakwa ebe ha nọ. Ha na-efukwa n'ebe ha magbu mbụ maọbụ chefuo okwu ha bụ n'uche ma ha na-enwe mkparịtaụka. Ihe ndị so eme ka ọrịa bawanye bụ na ndị mmadụ na-ebizi ogologo ndụ; ha anaghị anwụ n'oge Ọgwụgwọ Dementia O nweghi ọgwụgwọ eji aka maka ọrịa dịka ndị nnyocha sayensị na-agbasị mbọ ike ịrụpụta ọgwụ ga-akwụsị ya. Ya mere na achọtabeghị ihe jikọrọ 'amyloid' na ọrịa Dementia. Nke a pụtara na ndị nnyocha sayensi ka nwere ụfọdụ akụkọ gụnyere: - Gịnị na-egbu 'neurons' n'ụbụrụ - Kedụ ụdịrị 'protein' na-ejupute n'ụbụrụ - Ha kwenyere na achọta asịsa ajụjụ ndị a, ọ ga-eme ka achọta ọgwụgwọ ọrịa ahụ ngwa ngwa O doro anya na enwebeghi ọgwụgwọ maọbụ ọgwụ mgbochi Dementia mana ndị dọkịnta na-ekwukwa na o nwere ihe ndị mmadụ nwere ike ime iji gbochi ya. A mabeghi ihe jikọrọ omume ndị a na ọrịa 'dementia' mana nnyocha ka na-aga n'ihu." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58542851 +sports Leicester City: Ha achụọla onye nchịkọta ha ọsọ ụkwụ eru ala "Leicester City chụrụ Claude Puel bụ onye nchịkọta ha ka Crystal Palace ji ọkpụ goolu nyebaa ha afọ. Goolu anọ Wilfred Zaha, Batshuayi, na Milivojevic nyere, so kpọdo Puel n'obe e ji were ya chụọ aja. Na Evans satara otu goolu emeghi ka ndị nyere Puel ọrụ gbaghara ya maọbụ Jacky Bonnevay bụ osote ya. Ka e merichara ha n'abalị, Puel gwara ndị ntaakụkọ sị ""anyị agbaghị bọọlụ a ọfụma."" Puel chịkọtara Leicester City otu afọ na ọnwa anọ tupu a chụọ ya taa. Ntuliaka Sịnịgal Mba Senegal ga-eme ntuliaka nke ha taa, ebe ha ga-ahọpụta onye ga-abụ onyeisiala ha. Gbadokwa anya ma chere mgbe ngalaba Inec gụpụtara mpụtara ihe a tụtara na vootu tupu i kwuwe onye meriri na ntuliaka, makana mpụtara adịgboroja na-efegharị. N'otu aka ahụ, bata na BBC Igbo.com ịmata ihe niile banyere etu ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu a si aga nakwa mpụtara ndị a hụrụla anya. Akụkọ ruru anyị ntị kwuru na ọgbaghara dapụtara ebe ụfọdụ e mere ntuliaka dịka Legọs, Kogi nakwa Rivas steeti, ebe e gburu ụfọdụ, merụọ ụfọdụ ahụ makwa gbaa ụfọdụ igbe ntuliaka ọkụ. N'ofesi, Ihe ruru mmadụ narị anwụọla, ebe ihe ruru narị ọzọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ dị n'obodo Assam dị n'India maka mmanya ọkụ na-emerụ ahụ ha ṅụrụ. Nke a na-abịa ka ụdịrị ọdachi a gbukwara ihe ruru mmadụ narị n'obodo Uttar Pradesh na Uttarakhad. N'egwuregwu, Goolu atọ Leo Messi nyere ka Barcelona ji goolu anọ asatara abụọ merie Sevilla, mere ka ọ bụrụ ugboro iri ise ọ na-enye goolu atọ n'ime otu egwuregwu nke bekee kpọrọ 'hattrick' , kemgbe ọ gbawara bọọlụ. Gere akụkọ BBC n'otu nkeji: Ihe nkiri:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-47341643 +politics 'Ihe mere m ji si APGA banye Labour Party' - Victor Umeh "Sịnatọ Victor Umeh bụbu onyeisi otu Pati All Progressives Grand Alliance, APGA, n'aha ịchafụ ekwuola ihe mere o jiri siri n'APGA mafee Labour Party, LP. N'ajụjụ ọnụ BBC Igbo gbara ya ụnyaahụ n'ekwentị, Umeh sị na ọ bụ okwukwe ya na Onye Igbo ga-abụrịrị Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 kwanyere ya na LP. Ọ sị, ""unu ma na ọteela m tiwere mkpu ka Onye Igbo bụrụ onyeisiala Naịjirịa, ọ bụ Labour Party mejuputaara m ya bụ ebumnobi"". Mgbe onye ntaakụkọ BBC chetere ya otu o si akatọ Peter Obi mgbe mbụ, Umeh zara na ""Peter Obi bụ nwaanne m. Ọnweghị ihe na-esere mụ na ya anyị agaghị ekpezili. Iwe nwanne anaghị erụ n'ọkpụkpụ"". Umeh sị na ya chọrọ ịkwado Obi na ndọrọndọrọ nke onyeisiala ọ na-azọ na Labour Party iji mara ka ebumnobi ndị Igbo ọ ga mmezu. Cheta na, abalị olemaole gara aga, Dozie Nwankwo na-anọchite anyi ndị Anoacha/Dunukofia/Njikoka Federal Constituency n'ụlọomeiwu nta napụrụ Victor Umeh ohere ịzọ ọche Anambra Central senatorial zonụ n'APGA. Nwantịị ka Nwankwo ji merie Umeh na ya bụ ntuliaka imeụlọ ndị APGA bụ ebe Umeh chigoro dị ka onyeisioche afọ asatọ. Ha abụọ chịpụrụ ya maka oche nke Anambra Central senatorial zonụ nke Sineti bụ nke Dozie Nwankwo ji vooti dị 162 merie Umeh bụ onye nwere 151. Ndị tụrụ vootu ndị ahụ bụ ndị otu APGA sị okpuruọchịchị niile dị na ọgbọnta vootu nnọchiteanya sineti ahụ." https://www.bbc.com/igbo/articles/cyrdlpx45d7o +sports AFCON 2019: Senegal alụchaala ọgụ Algeria enwere akụkọ "Goolu Baghdad Bounedjah nyere ngwa ngwa e bidochara boolu (na nkeji abụọ) zuru ibunye Ọljiria Iko Mba Afrịka nke afọ 2019. N'asọmpi Iko Mba Afrika a gbara n'ụbọchị 19 nke ọnwa Julaị bụ nke ikpeazụ e ji ama mbe abụọ nke bụ oke, Sinigal gbakachara Ọljiria ahụ, mana o zughi inye ha iko ha chọ bịa. Egwu bọọlụ a biri n'otu ọkpụ, dịka Ọljiria butere Iko Mba Afrịka nke abụọ ha. Sadio Mane nke mba Sịnịgal gbara ebibi ụwa iji hụ na ha nyetara goolu, mana otu abụghị n'ezi. Dịka o si mee mgbe otu abụọ a zutere n'agba nke ndị otu n'asọmpi a (""Group Stage""), Ọljiria jikwa otu ọkpụ goolu a na-asataghị ihe merikwaa Sịnịgal ọzọ. Ikpeazụ Ọljiria hụrụ iko a anya tupu ha ebulie ya n'afọ 2019 a, bụ n'afọ 1990; mgbe ahụ amụbeghi onye ndu so ha bịa ije a bụ Riyad Mahrez. A mụrụ Mahrez n'afọ 1991; ka otu afọ Ọljiria ji metụ iko a aka gachara. Lee etu e si gbaa egwuregwu a:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49051562 +sports Norwich vs Manchester City: Norwich emeela Man City ka ewu akpụkpa ntị Norwich abụrụla anụ nkanka mpi dịka ha gosipụtara ike ha na asọmpi ha na ndị Manchester City. Na agbanyeghi na mmadụ iri ndị otu Norwich merụrụ ahụ, ha jị anya uhieuhie bata asọmpi a. Ọ bụ Kenny McLean kpuhere ite goolu dịka ọ sunyere otu na nkeji nke iri na asatọ. Mgbe ọ dị ka ndi ManCity ahụwala ụzọ , ka Todd Cantwell nyere goolu ọzọ na nkeji iri abụo na asatọ were chetara Man City ndị ha nọ n'ụlo ha. Dịka a na ajụ na Aguero osokwa n'asọmpị a ka o were isi takaa netị ndị Norwich na nkeji iri anọ na ise. Teemu Pukki gbara ndị Norwich ume dịka ọ sunyekwara goolu ọzọ na nkeji iri na ise. Goolu Rodri nyere na nkeji iri asatọ na asatọ dịka ManCity enwere olilwanya mana otu awụghị na ezie. Na ngwucha, mkpọtụ na-ada na Norwich City dika ha jiri ọkpụ goolu atọ asatara abụọ were chulaa ndị Manchester City. Lee ihe ndị ọzọ gbatara na Premier League taa: Liverpool 3 : 1 Newcastle Brighton 1 : 1 Burnley Man Utd 1 : 0 Leicester Sheff Utd 0 : 1 Southampton Tottenham 4 : 0 Crystal Palace Wolves2 : 5 Chelsea https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49703095 +entertainment All- women band: 'Ndị mmadụ na-ajụ anyị ọ ga-ekwe omume ụmụnwaanyị ịma akụ ngwa egwu' Evelyn Ike na-arụbu ebe a na-ere ngwa egwu tupu ọ bụrụ onye ndu otu egwu ụka ọ bụ naanị ụmụnwaanyị na-agụ ma na-etikwa ngwa egwu. Dịka o siri kọwaa, o si na ịmụ ka e si akpọ ụbọ akwara were malite ije ya n'iti egwu. Ya na ndị otu ekwu ya gwara BBC na mkparịtaụka na ihe ọbụla nwaanyị maọbụ onye ọbụla chọrọ ịmụta n'ụwa, na itinye uchu na ya, na onye ahụ ga-amụta ya. Ịgụ egwu bụ nka e nwere nwoke ma nwaanyị, mana ịkụ ngwa egwu dịka ịgba, ụbọ akwara na ụfọdụ ngwa egwu ndị ọzọ bụ ụmụnwoke na-emekarị ya na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijria. https://www.bbc.com/igbo/afirika-61290395 +religion Lee ihe Bishop Katọlik Enugu kwuru ga-eme dịka ụka Adoration Ministry na-emepe ọzọ Ụlọụka Adoration Ministry Enugu ewepụtala ozi kwuru na ha ga-amalite ịkawa ụka ọzọ n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba, 2022. Fada Ejike Mbaka bụ onyeisi ụka ahụ, binyere aka na ya bụ ozi e ziputere na Facebook ha. BBC kpọtụrụ Katọlik Dayọsis nke Enugwu steeti, nke Fada Mbaka nọ n'okpuru ya ma bụrụkwa ndị nyere ya mmachi a machiri ha kemgbe ọnwa Juun, 2022. Ha gwara BBC na n'ezie, Fada Mbaka ga-aka ụka ahụ n'ụbọchị ha ga-emepegharị ya bụ ụlọụka Adoration. Fada Benjamin Achi bụ ọnụ na-ekwuru Katọlik Dayọsis nke Enugwu steeti, gakwara n'ihu kwuo na ihe ndị ọzọ ga-eso ya ga-abịazị mgbe a kachara ụka ahụ n'ụbọchị Sọnde. N'ụbọchị 17 nke ọnwa Juun ka Bishop Callistus Onaga, bụ Bishọp Enugwu Katọlik Dayọsis, nyere iwu ka e mechie ụlọụka Adoration Ministry nke Enugwu steeti. N'ozi o ziputere ka ọ na-amachi ụlọụka ahụ, Bishọp kwuru na ha ga-eme nnyocha n'isi Fada Mbaka. O kwuru sị “N’ihi ọtụtụ ihe ndị na-eme n’Adoration Ministry nke megidere okwukwe na nkuzi ndị Katọlik; a dọọla Fada Mbaka aka na ntị ọtụtụ oge mana o geghi ntị na ntuziaka ndị a. Site n'ikike na ọrụ m dịka onyeisi ọzụzụ atụrụ nke Katọlik Enugwu Dayọsis, amachiela ndị Katọlik (ụkọchukwu, ndị ụka) ịga n’Adoration Ministry efe ofufe ruo mgbe e mechara nnyocha ndị ndu Katọlik na-eme n’isi Fada Mbaka”. Cheta na n'afọ 2021, Fada Mbaka jikwa aka ya mechie Adoration Ministry otu ọnwa na Mee, ka ọ gara ikpe ekpere otu ọnwa. Nke a mere dịka ọ rịọchara Bishọp Onaga mgbaghara maka ngagharịiwe nke ndị ụka ya mere nke butere ọgbaghara na mmebi ngwongwo ndị ụka. Fr Ejike Camillus Mbaka bụ ụkọchukwu Katọlik na-arụ ọrụ na Dayọsis nke Enugwu, na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Ọ bụkwaya ya bụ onyeisi ụlọ ekpere a na-akpọ 'Adoration Ministry Enugwu, Nigeria' (AMEN). E chiri ya ụkọchukwu n'ọnwa Julaị nke afọ 1995, nke pụtara na ọ rụọla ọrụ dịka ụkọchukwu ihe ruru afọ 27 ugbua. Otu ihe e ji mara Mbaka bụ na ọ na-ebukarị amụma gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, ntuliaka, nakwa ndị ga-emeri ntuliaka. https://www.bbc.com/igbo/articles/cjrnjzjnrxxo +health DNA Test: Zizi Cardow sị na ọ bụ ụmụnwaanyị na-ebute nsogbu 'Paternity fraud' Onye na-emepụta uwe ejiji ama ama bụ Zizi Cardow akọwaala ihe mere ọtụtụ ụmụnwaanyị lụrụla di ji apụ n'ezi tụrụ ime bubata n'ụlọ di ha. Cardow mgbe ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka sị na ụfọdụ ụmụnwaanyị anaghị enyocha ụdị nwoke ha chọrọ tupu ha alụọ ya. Ụdị nyocha ọ kpọrọ aha gụnyere, ahụike ma ọ ga-atụnyenwu nwaanyị ime, ntọala ezinaụlọ nwoke ahụ na ndịọzọ. Cardow gara n'ihu kwuo na ụdị ọkụ a na-acha ụfọdụ ụmụnwaanyị n'ezinaụlọ na-eme ka anya ha dị n'ezi. Kirie ihe Cardow kwuru n'uju. https://www.bbc.com/igbo/55759930 +sports Chelsea vs Arsenal: Chelsea na Arsenal adọrọla ka ofe ọkwụrụ gbara ụka Arsenal takwutere ya kọnkịrị n'aka Chelsea mana ha gosiri ike dimkpa iji jide onwe ha. Otu abụọ a nyere onwe ha goolu abụọ abụọ oge ha zutere na 'Stamford Bridge' n'aabalị Tuzde. Ndị Chelsea che na asọmpi ahụ ba-abụ ofe nkupu mana ha hụrụ nke tọrọ 'Bịati'. Oteghi aka asọmpi a malitere, David Louis gbaturu Tammy Abraham n'ime obi goolu ha nke mere ka a gbaara ya ụgbọ nwa mkpi ma nye Chelsea penariti. Gorginho gbakpuru penariti ahụ wee gbaara Chelsea aka ahịa. Chi ndị Arsenal zọrọ ha oge bọọlụ kụrụ Saka n'aka n'ime '18' mana ogbu opi ahụghị ya. Na nkeji 63, Gabriel Martinelli nyere goolu dị ebube wee saara ndị Arsenal ọnụ ha. Chelsea nyere goolu ọzọ si n'aka Ceaser Azpilicueta. Mana na nkeji 88 ka Bellerin nke Arsenal sakwara ya. Otu a ka ya bụ egwu si bee. N'asọmpi ndị ọzọ a gbara n'abalị Tuzde, Manchester city ji otu ọkpụ goolu merie Sheffield United. Aston Villa si azụ owere lọghachi wee merie Watford 2-1. Bournemouth na Brighton gbara 3-1, ebe Southampton meriri Crystal Palace 2-0. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51201018 +entertainment Pete Edochie ama eme ejije? "Ndị mmadụ na-adọrịta ụka na soshal midia maka ihe otu nwagbọghọ kpọrọ onwe ya Sugabelly kwuru sị na ""Pete Edochie amaghị ka esi eme ejije"". Sugabelly sị na Pete Edochie na-eme naanị otu ụdị ihe nkiri kamgbe ọ malitere ime ejije; na ihe nkiri ""abụghị naanị ịtụ ilu"". Okwu ya a gbarụrụ ihu otụtụ mmadụ bụ ndị sị na ọ bụ mkparị ka nwagbọghọ a kparịrị 'odogwu n'ihe nkiri' bụ Pete Edochie. @EdoFirstLady sị na ọ bụghị ihe ịtụnanya na ndị mmadụ na-atụnyere mmadụ na ibe ya dịka mgbe a sịrị na Beyonce ka Michael Jackson mma n'iti egwu. @Adunni_Achebe sị na Pete Edochie na-emekarị ihe nkiri ebe ọ bụ Eze apụtaghị na ọ maghị eme ejije. Ụfọdụ ndị kwenyere n'ihe Sugabelly kwuru; @lollypeezle sị Pete Edochie metụkwanụ ụdịrị ihe nkiri ọzọ, na ọ bụghị oke ihe ka a na-achọ n'aka ya. Dịka ịrụrịtaụka na-aga n'ihu, ka anyị lebanye anya na njem Pete Edochie n'ime ihe nkiri; Ndụ Pete Edochie na njem ime ihe nkiri ya: Ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụ Pete Edochie dịka otu n'ime ndị kachasị eme ihe nkiri n'Afrịka. Anaghị agụ aha ndị na-emete ọnụ ha n'ejije na Naịjiria nakwa Afrịka ghara ịkpọ aha ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50320810 +health Covid-19 n'otu nkeji: 'Mask' a ga-egbochi gị ibute ọrịa Coronavirus? Dịka ndị mmadụ na-ekpuchi imi na ọnụ ha iji gbochie ibute ọrịa Coronavirus, ụfọdụ na-ajụ kedu nke bụ eziokwu https://www.bbc.com/igbo/afirika-52040815 +health Coronavirus: Idris Elba ebutela coronavirus Onye na-eme ihe nkiri a ma ama bụ Idris Elba ebutela coronavirus dịka o si kwuo n'akara soshal midia ya. Elba sị na e nyochara ya n'ụtụtụ taa ma chọpụta na o bu ọrịa coronavirus. O kwuru na ya na onye bu ọrịa a nwere mmekọ ahụ n'ụbọchị Fraịde. Ọ sị na onwebeghi etu ahụ si eme ya ugbua mana ọ gbachiela onwe ya n'ụlọ maka nke a. Ọ rịọkwara ka ndị mmadụ na-asa aka oge ọbụla ma dosa ebe ha bi ọcha mgbe niile. Mba Briten amachiela ime njem, ọgbakọ maka coronavirus Boris Johnson, onyeisiala mba Briten agbarụọla ihu kwuo ka ndị mmadụ bi na UK kwụsị ịme njem na-adịghị oke mkpa bụ nke ga-ebenata mmekọrịta ndị mmadụ na ibe ha maka mgbasa Coronavirus dịka ọnụọgụ ndị nwụgoro na ya bụ ọrịa rugoro iri ise na atọ. Johnso kwuru ka onye ọbụla nwere ike sị na ụlọ ha na-arụ ọrụ dịka otu n'ime usoro ọhụrụ gọọmenti wepụtara iji buso ọrịa a agha. O kwuru ka ndị rugoro afọ iri asaa nakwa ndị ahụ esichaghị ike nwere okwuo kpọrọ ihe. Ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja akwụsịla nchutu Adams Oshiomole dịka onyeisioche pati All Progressive Congress. N'ikpe ndị ọkaikpe atọ nke ọkaipke Abubakar Yahaya nọ n'isi ya chabiri n'ụbọchị Mọnde, kwuru ka nchutu Oshiomole nke ụlọikpe ukwu nyere iwu ya kwụsị. Ụlọikpe a sị na iwu a ga-adị ruo ụbọchị Fraịde mgbe a ga-eleba anya n'akwụkwọ Oshiomole gbara. Cheta na ụlọikpe dị n'Abuja nyere iwu n'ụbọchị 4 Maachị ka Oshiomole kwụsị igosi onwe ya ka onyeisi APC. Nlele nke mbụ ọgwụ mgbochi coronavirus ga-amakite ụbọchị Monde na mba Amerika, dịka anyị nụru. Mmadụ iri anọ na ise ahụ dị mma ekwetala ịnara ya bụ ọgwụ n'ụlọ ọchacha dị na Kaiser Permanente, Seattle. Ya bụ ọgwụ nwere oyiri ya bụ nje dị na ya mana ya bụ nje ezughị ibute ya bụ ọrịa n'ahụ mmadụ. Ndị ọkachamara na-ekwu na ọ ka ga-ete aka tupu amara ka ya bụ ọgwụ maọbụ ọgwụ ndị ọzọ na-emepụta ọ ga-arụ ọrụ. Ndị ọrụ Sayensi n'ụwa gbaa gburu na-agba mbọ ịmata ka ha aga emepụta ọgwụ mgbochi ọrịa a ngwangwa. Ndị weputere ego maka nnwale ọgwụ a nke mbụ n'ahụ mmadụ bụ ndị National Institutes of Health sị na ha mafere usoro nke mbụ e si anwale ọgwụ mgbochi bụ nke na-enye aka ịmata ka ya bụ ọgwụ ọ ga-adịkwa ire n'ahụ mmadụ. Mana ụlọọrụ na-ahụ maka ya bụ nchọcha bụ Moderna Therapeutics sị na usoro eji mepụta ya bụ ọgwụ bụ usoro e ji emepụta ọgwụ mgbochi kemgbe ụwa. Na Lọs Angelis dị na New Yọk dị Amerịka, ọ bụ emechiela ebe a na-ere nri na mmanya. Ghana, Kenya, Saụt Afịrịka nakwa ụfọdụ mba ndị ọzọ amachiela ndị si mba nje fesara ọfụma ịbata. Saụt Afrịka na Sierra Leone emechiela ụlọakwụkwọ. Moroko amachiela ụgbọelu si mba ofesi ịbata mba ahụ. Nke mere ka ụfọdụ na-aju ihe ji Naịjirịa. Ngalaba na-ahu maka mbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na nyocha e mere onye eche na o nwereike buru coronavirus n'Enugwu gosiri na ya bụ nje adịghị ya n'ahụ NCDC sị na ọ dị mkpa ichere ka emecha nchoputa tupu ndi mmadụ eburu asịrị kpagharịwa. Cheta na akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na ọ bụ otu nwaanyi si ofesi lọta ka a na-eme nyocha makana ọ na-akwa ụkwara. N'otu aka ahụ, Dọkịnta Ifeanyi Agujiobi bụ onye odeakwụkwọ kọmịsọna ahụike n'Enugwu, site n'akwụkwọ o nyere ndị mgbasaozi, kwenyekwere n'ihe NCDC kwuru ma sịkwa ka ndị mmadụ ka na-adị ọcha ma na-agbado anya. Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari etiela ndị igwe gassị gbara ka ogbunigwe na Legọs metụtara aka n'obi. Ọ sị na NNPC na-agba mbo ịchọpụta ihe kpatara ya bụ mberede. Ngalaba gbata gbata na Legọs kwuru na ha butere ozu mmadụ iri na asaa nwụru na ya bụ ọdachị ebe mmadu iri abụọ na ise merụrụ ahụ. Joe Biden na Bernie Sanders ji Donald Trump mere okwu ka ha zutere n'ogige achụmta vootu onye ga-ebu kọlọtọ pati demokrat zọzị ya ọchịchii n'ọnwa Novemba. Ha abụọ sị na Trump ezughi ka emee ma ncha, ọkachasị etu o si ebuso Coronavirus agha. https://www.bbc.com/igbo/afirika-51904229 +politics Anambra election update: Etu m si gụọ akwụkwọ ma ruo n'ogogo m nọ ugbua - Senator Andy Uba Sịnetọ Andy Emmanuel Uba akọwaala etu o si too, gụọ akwụkwọ ma rụọ ọrụ rute n'ogogo ọ nọ ugbua. Uba bụ onye ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa gọvanọ n'Anambra Steeti ga-adị n'ọnwa Nọvemba sị na ọ bụ onye Uga dị n'Anambra mana a mụrụ ya n'Enugwu Steeti. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ gụrụ akwụkwọ n'Enugwu nakwa n'ala bekee. Kirie ihe o kwuru banyere onwe ya n'uju; https://www.bbc.com/igbo/afirika-58988772 +health Benefits of Bitter Leaf: Etu m si malite ịkọpụta olugbo ebe o buru ibu - Elochukwu Anozie Elochukwu Anozie bụ onye nwere ugbo ebe ọ na-akọ naanị olugbu akọwaarala BBC Igbo etu o si malite. Anozie kwuru na ọ gụkwara akwụkwọ mana ọ gụchaghị tupu ọ banye ịkọ olugbu bụ ebe o si akpa nri ugbua. Ọ kọwakwara usoro e ji akọ nakwa elekọta ya anya. O kwuru na ọ ga-amasị ya ma olugbu ọ na-akọ gatee aka ma gazuo ụwa. Gee ihe ndị o kwEtu e si akpata ego site n'ịzụ ọkụkọ Bekeeuru n'uju: https://www.bbc.com/igbo/afirika-58713443 +health Down's Syndrome: Etu ị ga-eji nyere nwa nwere 'Down's Syndrome' aka Ijeoma Fyncotri bụ nwaanyị mụrụ nwa nwere nkwarụ Chocho Bekee kpọrọ down syndrome. Ijeoma kọrọ ka obi sị daa ya mba mgbe ndị dọkịnta gwara ya na nwa ya nwere ya bụ nkwarụ. Ihe onyonyo a ga-egosikwa gị ụlọakwụkwọ ebe a na-ekpokoba ndị nwere nkwarụ a na ka ha sị azụlite ha. Ọ bụ Chigozie Ohakana Vining Ogu mere akụkọ a https://www.bbc.com/igbo/media-51986658 +sports Lyon na Mancity: Ntakịrị Lyon agbanyụọla 'mic' ndị Manchester City Otu egwuregwu bọọlụ Olympique Lyon azaala ogbu agụ ọzọ dịka ha ji ọkpụ goolu atọ a satara otu dulaa Manchester City n'asọmpi Champions League n'abalị Satọde. Cheta na ọ bụ Lyon dulara Cristiano Ronaldo na ndị Juventus n'asọmpi a n'izu gara aga. Cornet nyere otu goolu ebe Mousa Dembele nyere goolu abụọ Lyon ji merie. Kevin de Bruyne bụ onye nyeteere Man City otu goolu ha ji gbaa aka ahịa. Nke a pụtara na ọ bụ Lyon na Bayern Munich ga-ezute onwe ha iji mara onye ga-etozu iso gbaa asọmpi nke ikpeazụ nke iko Uefa Champions League. https://www.bbc.com/igbo/afirika-53795689 +sports Under-23 Nations Cup: Ụmụ Naịjirịa ji ọnyụpa malite iko mba Afrịka "Aka wụrụ ụmụ Naịjirịa ndị 'under 23' n'isi taa. Ọnyụpa ka ha ji malite asọmpi iko mba Afrịka maka ndị na-akarịghị afọ iri abụọ na atọ. Ọbụkwa asọmpi a ka a ga-eji họta ndị ga-aga egwuregwu 'Olympics' nke afọ 2020. Ha na ndị Ivory Coast zutere onwe ha taa n'egwuregwu mbụ ha na ya bụ asọmpi. Mana ha agbataghị ọnụ ha n'ihi na Ivory Coast ji otu ọkpụ goolu kọwaara ha ihe ọkụ ji ntị oke eme. Penariti ka Silas Gnaka ji gbakaa neetị na nkeji 71 n'egwuregwu ahụ. Ọbụ Olisa Ndah gbaturu mmadụ n'ihu goolu nke mere e ji nye ya akwụkwọ ọbara ọbara ma gbaara ya ụgbọnwamkpi. Naịjirịa nọ n'otu 'B' n'asompi ahụ. Ndị ọzọ nọ'notu ahụ gụnyere Ivory Coast, Saut Afrịka, na Zambịa. Okaiwu e ji nkwalite ikike dịịrị onye mara bụ Femi Falana ekwuola na ọ na-adị ya ka onyeisiala Buharị ọ na-akpa nkata ịchị Naịjirịa nke ugboro atọ. Falana gwara BBC na mmekpa ahụ niile a gọọmentị etiti na-emekpa ndị ntaakụkọ bụ iji mee ka ụjọ ghara ikwe ha kwuo ihe ọbụla mgbe ha ga-amalite atụmatụ 'third term' ha bu n'obi. Mba Zimbabwe achụọla ndị dibia bekee ruru narị abụọ n'ọrụ n'ihi ngagharịiwe ha na-eme iji kwuo ka e bulie ụgwọọnwa ha. Gọọmentị Zimbabwe kwuru na ha enweghị ego ọbụla iji buliere ndị dọkịta ụgwọọnwa. Ndị dọkịta na-ewe iwe na ego a na-akwụ ha enweghị ihe ọbụla ọ na-ezuru ha. Nke a bụ maka oke ihe isi ike dị na Zimbabwe ugbua. Ihe a na-akwụ ndị dọkịta zimbabwe ugbua erughi otu narị dọla. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara bụ Haruna Mohammed sị na gwomgworo bu mmanụ ụgbọala dara n'ụzọ Zik dị n'Ọka bụ isi obodo Anambara steeti n'elekere asaa nke ụtụtụ taa. Maazi Mohammed sị na ndị ọrụ ha nakwa ndị ọrụ gbata gnata ntịnyụ ọkụ nọ n'ogige ihe a mere. ""Anyị na-agba mbọ ịhụ na ndị mmadụ abanyeghi iku mmanụ a, ma hụ kwa na onweghị ihe mberede ọbụla si n'ihe mere pụta. Nke a na-eme ihe ruru gwomgworo anọ dara n'Anambara n'ime izuụka anọ. Nke mbọ batara n'akụkọ BBC Igbo bụ nke butere ọkụ ọgbụgba ahaịa Ọchanja. Gọọmentị Anambara ji maka oke ọdụda gwomgworo a manye iwu ka ha gharị ịgba n'ehihe. Ọchịchịrị gbara n'ọtụtụ ebe na Naịjirịa Nwanne i nwere ọkụ latrik n'ogbe gị? Ọ bụrụ na i nweghi ọkụ mara na ọ bụ n'ihi nsogbu igwe ọkụ nwere na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa. Akụkọ na-ekwu na steetị ndị nke a metụtara gụnyere Legọs, Abuja, Kano nakwa ọtụtụ ebe ndị ọzọ. N'ofesi Ụlọikpe kachasị na mba India a chabiela ikpe sị ka e were ala nsọ a kpọrọ Ayodhya d��� na mpaghara ugwu India nye ndị okpukperechi Hindu. Ndị okpukperechi Hindu na ndị Alakụba na-azọ oke ala nsọ kamgbe ọtụtụ iri afọ gara aga. Ụlọọrụ nchekwa DSS sị n'ezie na ha anatala iwu sị ka ha tọhapụ Omoyele Sowore kama na o nwebeghi onye bịara ịkpọrọ ya. Nke a dị n'ime akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Peter Afunanya wepụtara n'ụbọchị bụ abalị asatọ nke ọnwa Nọvemba, 2019. Ọ sị na ha agwala ụlọikpe nyere iwu a na-onwebeghi onye bịara sị na ọ chọrọ ịkpapụta Sowore. Afunanya gara n'ihu kwuo na ụlọọrụ ha abụghị nke na-enupuisi n'iwu ụlọikpe nyere. Mana ọkaiwu Sowore bụ Femi Falana gwara BBC nwanne ụnyaahụ na o zipụla ndị ọrụ njem ịkpọlata nwa amadị ahụ. Falana kwukwara na ya ga-agba DSS akwụkwọ maka ha emeghị ihe ụlọikpe sị ha mee. Ego e ji arụ ụzọ dị obere - Ụlọomeiwu nta Kọmiti ụlọomeiwu nta na-ahụ maka okporoụzọ sị na ijeri naịra iri abụọ na itoolu amawapụtara maka ịrụzi ụzọ agaghị ezu n'ihi ọnọdụ ọjọọ okporoụzọ Naịjirịa dị. N'otu aka ahụ, pati anọghị n'ọchịchị bụ PDP sị ka mịnịsta na-ahụ maka ọrụụzọ bụ Babatunde Fashola rịtuo n'ọkwa n'ihi okwu ha si na o kwuru maka ọnọdị okporoụzọ. A tọhapụla onye bụbu onyeisiala mba Brazil bụ Luiz Inacio Lula da Silva dịka ọ nọchara ihe karịrị ọnwa iri na asatọ n'ụlọ mkpọrọ. A tụrụ Lula mkpọrọ n'obodo Curitiba n'ihi ebubo nrụrụaka. Ọkaikpe sị ka a tọhapụ ya ma nye ya ohere ị gaa n'ụlọikpe mkpegharị ga zara ọnụ ya. Ndị otu egwu bọọlụ Chelsea na-achakezi ka kpakpando ugbua. Goolu abụọ asataghị asata ka ha ji pịawaa ndị Crystal Palace azụ na mgbede Satọdee. Tammy Abraham na Christian Pulisic bụ ndị nyere Chelsea mmeri. Chelsea emeriela asọmpi isii ikpeazụ ha gbarala. Nke a mere ka e tunye onye nkuzi ha bụ Frank Lampard ugo dịka ọkaibe n'ọnwa October. Onye nchịkọta Arsenal n'oge mbụ bụ Arsene Wenger na otu egwuregwu Bayern Munich ga-enwe mkparịta ụka n'izuụka ọzọ maka iwere ọnọdụ dịka onye nchịkọta ha. Cheta na Bayern Munich chụpụrụ Niko Kovac onye jibu ọkwa onye nchịkọta ha n'izu a. Nkeji Ihe nkiri" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50358134 +politics PMB in Ondo: Ị hụrụ ihe mere mgbe Onyeisiala Buhari gara n'Ondo steeti? "Ka e si apịatu ndị mmadụ bịara ikele Onyeisiala Buhari ka ọ gbụsara ụkwụ n'Ondo steeti: Lee ka Bashir Ahmed si gosi ihe onyoonyo a n'akara Twitter ya: Hosni Mubarak aka chịburu Egypt anwụọla n'afọ 91 Onye chiburu Egypt bụ Hosni Mubarak, nke ndị agha mba ahụ chụpoụrụ n'afọ 2011 mgbe ọ nọ n'ọchịchị anwụọla n'ụlọgwụ dị na Cairo. Ọ dị afọ iri itoolu wee nwụọ. Mubarak nọrọ afọ atọ n'ọchịchị tupu e nwee ọgbaghara na mba Ijipt. Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Hosni Mubarak. Ụwa niile gbakọrọ n'ọgbọ egwuregwu 'Staples Center' na mba Amerịka iji ruo ụjụ maka ọnwụ Kobe na Gianna Bryant. Kobe Bryant bụ onye e ji ịkụ bọọlụ nkata mara n'ụwa niile; ya na nwa ya nwaanyị bụ Gianna, nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu helịkọpta na mbido ọnwa Febrụwarị a. N'emume ụlọakwa ahụ, anya mmiri na akwa arịrị jupụtara ebe dum mgbe ndị mmadụ na-akọwa maka ndụ Kobe Bryant na nwa ya. Nwunye Kobe Bryant bụ Vanessa, kwuru na Chineke ma na di ya hụrụ nwa ya nwaanyị n'anya nke ukwu nke mere o ji kpọrọ ha abụọ otu ụbọchị. O kwuru na ya nwere okwukwe na Kobe na Gianna nọ ebe ka mma ugbua. Onye ọzọ kwuru okwu n'emume ahụ bụ Michael Jordan, onye bụ ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ nkata tupu ọ laa ezumike. Jordan bere akwa oge ọ na-ekwu okwu n'ihi ịhụnanya o nwere n'ebe Kobe nọ. Ọ kpọrọ Kobe ""nwanne m nwoke nke nta"", ma kwuo na ihe na-adabara ha abụọ nke ọma. Ndị ọzọ a ma ama gara ya bụ emume gụnyere Beyonce, Christina Aguilera, Jennifer Lopez na Alicia Keys. Ndị otu pati PDP agwala ụlọikpe kachasị ka ha lebakwa anya ọzọ n'ikpe gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa, nakwa nke steeti dị iche bụ nke ụlọikpe ahụ kwuru na APC meriri. Nke a na-abịa dịka ndị APC gwara ụlọikpe kachasị ka ha kpegharịa ikpe gbasara ntuliaka gọvanọ Bayelsa na Zamfara bụ nke ha kpebiri na PDP meriri. O teela ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ a ji atakọrịta onwe ụkwụ. Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu enyela iwu ka e nyochaa ihe kpatara ọnwụ otu nwaokorobịa onye ọgba bọọlụ aha ya bụ Tiyamiyu Kazeem, onye a na-ekwu na ọ bụ ndị SARS gburu ya. Kazeem na-agbara otu egwu bọọlụ Remo Stars nke dị n'Osun steeti. Akụkọ kwuru na ndị SARS si n'ụgbọala na-aga aga tụpụ Kazeem. Mana ndị SARS na-agọ agọ na ọbụghị ha gburu ya kama na ọ bụ ụgbọala kuturu ya oge ọ chọrọ isi n'aka ha gbapụ. Coronavirus Otu ahụike mba ụwa bụ WHO agwala mba dị icheiche ka ha kwado nkeọma maka igbochi ọrịa ọjọọ coronavirus dịka ọ na-agbasa n'akụkụ ụwa niile. N'ụbọchị Monde, e nwetara ozi na ọrịa a abaala mba Iraq, Afghanistan, Kuwait, Oman na Bahrain." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51626484 +health Sniper: Tupu i fee ya na nri gee ntị "Ndị mmadụ na-atụ ụjọ ka a hụchara ihe nkiri gosiri ka a na-efe 'sniper' n'elu agwa, ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ ihe nwere ike iweta nsogbu ahụike ma ọ bụrụ na a kpachaghị anya. BBC jụrụ ọkachamara n'ihe gbasara nri bụ Taiwo Ubany, ma e nwere ihe dị njọ n'ife ọgwụ e ji egbu ahụhụ n'elu mkpụrụ nri. O kwuru na ọ dịchaghị njọ, mana ọ na-aka mma ka ọ bụrụ onye ma anya ya (ọkachasị onye a zụrụ n'ime ya) ga-efe ya na nri. O kwuru ""enwere ọgwụ eji egbu ahụhụ nke na-adị mma ife na mkpụrụ nri ma na gburugburu ụwa, ya mere na ndị na-eme ihe gbasara nri ma na enwere ndị nke nwereike imebi ahụ, mana ebe ha ma nke a, ha makwa oke ha ekwesịghị igafe. ""Ndị ọkachamara na nri agaghị agafe oke ahụ, abịa na ndị nke na-arụpụta nri, ndị ọrụ ha bụ ihụ na ha si n'usoro iwu arụpụta ya na-abịa elenyere ha anya ịhụ na ha agafeghị oke a. ""Ị kwuo maka kemịkal ndị a na-etinye na nri, enwere usoro e ji etinye ya iji echekwa mkpụrụ nri dịka edere ya n'ahụ karama kemịkal ahụ. ""Mana enwere usoro dịka ịkụ ya mmiri were gwagbuo ya tupu e fee ya na mkpụrụ nri, nke bụ na ụtọ na isi ya ekwesịla ịpụ mgbe ọ na-erutela n'ahịa. ""Ya mere o ji dị mma ka ọ bụrụ onye a kụzirila n'usoro e ji eme ya (onye ọkachamara). Ya mekwara e ji ekwu na ọ na-adị mma ịsa ihe nri si n'ahịa ugboro ugboro ruru atọ maọbụ anọ, tupu e sie ma rie ya. Ihe o nwereike ime n'ahụ Ubany kwuru na kemịkal ndịa nwere ike ibute ọrịa kansa n'ahụ ma e mechaa, makana kemịkal ndịa nwere ihe ndị dị iche iche o na-arụ n'ahụ. O nwekwara ike ime ka ihe Bekee kpọrọ ""immune system"" dị n'ahụ gị ghara isi ike, nwee ike chekwaa ahụ gị. Etu ị nwereike isi gbanarị kemịkal na nri Akụkọ ndị ga-amasị gị :" https://www.bbc.com/igbo/afirika-46183760 +politics Anambra Governorship Election: Mkposa e kposara ọchịchị PDP Anambra, ọ ga-enye ha nsogbu na ntuliaka 'Primary' ha? "Ndị isi pati 'Peoples Democratic Party' n'Abuja ekposaala ọchịchị pati PDP nke Anambra steeti. Nke a si n'akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Kola Ologbondiyan wepụtara n'ụtụtụ Fraịde. Ologbondiyan kwuru na nke a bụ n'ihi mkpebi nke ụlọikpe nyere n'ọdị nso a gbasara ọchịchị pati PDP n'Anambra. Ka ọ dị ugbua, ndị isi pati PDP na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ga na-achịkọta PDP nke Anambra ruo mgbe a haziri ndị ọchịchị ọhụrụ na steeti ahụ. Ologbondiyan kwukwara na a họpụtala mmadụ ise bụ ndị ga-achịkọta ntuliaka imeụlọ nke ndị PDP Anambra ga-eme n'ụbọchị 26 nke ọnwa a iji họpụta onye ga-anọchi ha na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti nke ga-adị n'ọnwa Nọvemba. Mmadụ ise ahụ bụ: Ịchụ nta vootu amalitela n'ozuzu oke n'Anambra steeti maka onye ga-anọchi anya Gọvanọ Obianọ. Ọtụtụ na-ekwu na otu ndọrọndọrọ a ga-aka lekwasị anya na ntuliaka a bụ ndị 'All Progressives Congress' (APC), All Progressive Grand Alliance (APGA), na 'Peoples Democratic Party' (PDP). Mana ndị pati APC na-ekwu na ọgụ dị n'etiti APGA na PDP ga-enyere ha aka na ya bụ ndọrọndọrọ. N'ụbọchị Wenezde ka Chukwuma Soludo tuuru ugo dịka onye ga-anọchite anya ndị APGA na ntuliaka Anambra. Mana APGA kere ụzọ abụọ, otu ụzọ bụ nke Jude Okeke nọ n'isi ya, nke ọzọ bụ nke Victor Ike Oye nọ n'isi ya. Ọ bụ otu nke Ike Oye ka Gọvanọ Obiano na Soludo nọ na ya, mana otu nke Jude Okeke na-ekwu na haachụọla Soludo n'otu ha. Ya bụ ihe na-adị ụfọdụ ka ọ bụ egwuregwu, mana ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ ụdị ihe a mere na Rivers nakwa Zamfara steeti, ebe INEC chụpụrụ pati APC n'ihi na ha adịghị n'otu. N'aka nke ọzọ, PDP bụ pati nke aka chịburu Anambra steeti bụ Peter Obi nọ na ya. Mana ya bụ pati kekwara ụzọ abụọ, otu bụ nke onyeisi ya bụ Ndubuisi Nwobu, nke ọzọ bụ nke onyeisi ya Ejike Oguebego. Ụlọ ntaakụkọ Daily Trust dere etu nkewa a si adọri PDP, nke pụtara na ntulaiaka ọkwa Gọvanọ n'Anambra nwere ike ịkwa ha. Mgbe BBC kpọturu Nnamdi Nwangwu, ọnụ na-ekwuru ndị PDP Anambra steeti, o wee kwuo na ""onweghị nkewa dị na PDP"". ""Onyeisioche PDP n'Anambra bụ Ndubuisi Nwobu. Ejike Oguebego bụ onye chịrị PDp n'oge gara aga."" Nwangwu kwuru na PDP na-akwado nke ọma maka ntuliaka imeụlọ ha nke ga-adị n'ụbọchị Satọdee, abalị 26 nke ọnwa June. APC bụ ndị nwere ike irite uru na nkewa a dị na PDP nakwa APGA, maka na ala adịghị mma bụ uru ndị nze. Ọ bụ na pati a ka Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ, bụ Chris Ngige, nọ na ya. Ọnụ na-ekwuru ndị APC n'Anambra bụ Okelo Madukaife, kwuru na ha adịla njikere ịchutu maka ntuliaka nke imeụlọ ha. ""Anyị anaghị eku ume etu ha (PDP na APGA) si eku ume,"" Madukaife na-ekwu. ""Onye ọbụla bụ onye APC ga-eso tụọ vootu iji kwuo onye ha chọrọ ka ọ nọchite anya pati anyị."" Gbasara okwu nkewa dị na APGA nakwa PDP, Madukaife kwuru na ""ọ bụ ekpere ka m na-ekpe ugbua."" Ọ gara n'ihu kwuo na mmadụ iri na anọ egosila mmasị ha na APC iso zọọ ọkwa gọvanọ na ya bụ pati. Cheta ihe mere pati APC na Rivers steeti nakwa Zamfara steeti na ntuliaka 2019. Na steeti abụọ, APC kewara abụọ nwee ndị isi oche dị icheiche. Otu abụọ a mechara ntuliaka 'praịmarị' n'otu n'otu ma wepụtakwa ndị ha sị ga-anọchite anya ha. Mana ngalaba INEC anabataghị nke ọbụla n'ime ha n'ihi na ha agbasoghi iwu ntuliaka. Nke a megidere ruo mgbe oge INEC nyere maka idebanye aha ndị ga-eso zọọ ndọrọndọrọ gafere, nke mere ka a chụpụ ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-57594974 +health Covid 19 n'otu nkeji: Ite okwuma o nwerike igbochi coronavirus Okwuma nwere ọtụtụ ihe ọ na-egbochi nke ejiri mara ya. Mana ụfọdụ mmadụ ekwupụtala na e ji okwuma agwọ coronavirus ma a na-ete ya aka. Kirie ihe onyoonyo a ka ị mara ma ọ bụ eziokwu. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Chimamaka Ihenacho na Chimezie Ucheagbo https://www.bbc.com/igbo/media-52100235 +health Pulmonary fibrosis, Vitiligo, Alopecia na ọrịa ndị ọzọ bụ ọ gbara Igbo gharịị Enwere ọrịa dị iche uche na-arịa mmadụ, ọtụtụ ha na-edo anya dịka e nwere ọtụtụ ndị mmadụ na-arịa ya nke merela ka e nwee nchọpụta niji ghọta ha nakwa ụzọ ọgwụgwụ ha. Mana e nwere ọrịa ndị bụ ọgbara Igbo gharịị n'ihi na ọ na-atụwanye atụnwanye nke mere ka ọtụtụ na-aghọtahie ha maọbụ na-asọ ndị ọ na-arịa asọ. Ọrịa ndị ahụ gụnyere Pulmonary fribosis, vitiligo alopecia, haemophila dgz. 1. Pulmonary fibrosis Nke a bụ ọrịa na-emetụta ngụ site ime ya ka ọ taa ọnya ma nwekwaa apa ọnya, nke na-eme ka ngụ onye ahụ ghara ị na-arụ ọrụ ka o kwesịrị. Njirimara: Njirimara ọrịa a gụnyere ikuli ume elu, ụkwara ọkpọnkụ, ike ọgwụgwụ, ịta ahụ, nakwa ahụ mgbu. Ihe nwere ike ibute ya: Otu 'American Lung Asssociation' kọwara na ịnọ ebe ihe mmekpa ahụ dịka 'asbestọs' nsị nnụnụ maọbụ nsị anụmanụ ndị ọzọ maọbụ ịṅụ sịga nwere ike ịkpalite ọrịa ngụ a. Ọgwụgwụ: Dịka ndị ụlọọgwụ Mayo Clinic sị kọwaa na websaịtị ha, a naghị agwọ ọrịa 'pulmonary fibrosis' agwọ kama a na-eleta onye ọ na-arịa. Iji maa atụ, a na-enye onye ume na-ara ahụ n'ihi ọrịa ahụ igwe nkuume ma na-agbakwa ya ọgwụ 'antịbiotics iji belata nsogbu ndị so ọrịa ahụ. Vitiligo bụ ọnọdụ ahụike na-emetụta anụ ahụ mmadụ n'ihi enweghi mmiri ahụ dị mkpa a kpọrọ 'melani' na Bekee. Ọrịa a anaghị ahụ onye ọ na-eme kwa daa, emela ụfọdụ ndị ama ama dịka Michael Jackson bụ ọnọdụ anaghị ahụ. Njirimara: Ọnọdụ ahụike a na-eme anụahụ mmadụ chagharịa na-emetụtakarị ọnụ, anya, mkpịsịaka, apata, abụ ime ọnụ maọbụ mbada ahụ onye na-arịa ya. Otu na-agbasa ozi maka ọrịa a bụ 'Vitiligo Society' sị na ọ dị ụzọ atọ; 1. Nke na-eme otu ebe n'ahụ mmadụ, 2. Nke na-eme n'ọkara ahụ mmadụ 3. Nke na-emekaarị n'ahụ nile Ọtụtụ mgbe, o nweghị mmekpa ahụ ọbụla vitiligo na-eme onye nwere ya. Mana o nwere ike ibutere gị anya mgbu maọbụ nsogbu anụchaghị ihe ọfụma. O nwere ike ime mmadụ ọ gaghị enwezi nkwenye na onwe ya. Ihe ọzọ dị mkpa bụ na ihe ruru mmadụ pasentị 15 rue pasentị 25 nwere nsogbu vitiligo nwekwara ike inwe nsogbu ọrịa ime ahụ dịka ọrịa shụga, rheumatoid arthritis, ụkọ ọbara (perniiiuos anaenia). Ọgwụgwọ: A naghị agwọ Vitiligoio agwọ kama o nwere ude dọkịta nwere ike inye gị iji gbajilata nchagha ahụ ahụ. Ọnọdụ a ma dịka Alopecia areata: bụ nsogbu na-eme ka ntutu ghara ịto mmadụ n'ahụ n'ebe niile a ha-ahụ ntutu dịka isi, ahụ, mpempe anya nakwa na agba. Haemophila Haemophila bụ ọrịa ọbara nke na-ame ọbara ịkwụsị ịgba mmadụ ma o merụọ ahụ maọbụ a waa ya ahụ. Ihe na-ebute ọnọdụ a na-emekaarị ụmụnwoke na-esi n'ezinaụlọ. Njirimara: Ihe ndị e ji ama onye nwere nsogbu a gụnyere; ezuimi (nosebleeds), ọbara ịdị na mammịrị ma ọbụ na nsị, ịgbabiga ọbara oke ma ị gbaa ọgwụ, nakwa ahụ mmadụ ịta nuukwu ọnya. Mayo Clinic kwuru na ọ bụrụ na mmadụ nwere 'haemophilia nke ọjọọ ya kupuo isi ya, na ọbara nwereike ịbanye n'ime ụbụrụ ya nke nwereike butere ya oke isi ọwụwa, ahụchaghị ụzọ ọfụma, ike ọgwụgwụ, ihe ọdịdọ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-61054143 +health Eye care: Ihe ise ị ga-eme ka anya gị ghara ịkpọ Anya mmadụ bụ ugogbe o ji ahụ ụwa. Ya mere o ji dị mkpa ka ọ kpachapụrụ ya anya. Onye ọkammụta n'ihe gbasara ilekọta anya bụ Nneoma Sibigam kwuputara ihe ise i ga-eme iji chekwa anya gị. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Adline Okere https://www.bbc.com/igbo/media-52689091 +religion Ihe mere m ji hapụ ọrụ uweojii chie Fada n'ụka Katọlik Fada Cajetan Obiekezie nke ụka Katọlik Awka dayọsis gwara BBC Igbo ihe mere o ji hapụ ọrụ ya dịka onye uweojii ma chie Fada. Ọ sị na ọ na-ewete ya ma ọ hụ ka mmadụ na-emegbu mmadụ ibe ya, na ọ ga-ahụ na onye tara ahụhụ ruru ya na-agbanyeghi onye ọ bụ. Na ọ bụ mere o ji banye n'ọrụ uweojii, gụọkwa akwụkwọ dịka ọkaiwu nakwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N'ihi ọrụ nakwa agụmakwụkwọ ya mere ọ jiri ruo ogogo 'Superintendent' n'ọrụ uweojii. Mana n'ihi etu okwu Chukwu ji atọ ya ụtọ nakwa mmasị o nwere n'ịgụ akwụkwọ nsọ mere o ji hapụ ọrụ uweojii ma chie Fada. Kirie ihe o kwuru n'uju. https://www.bbc.com/igbo/afirika-54963824 +sports Lee ụmụ Naịjirịa na-aga 'World Cup' n'afọ a Asọmpi iko mba ụwa nke afọ 2022 ga-amalite n'ụbọchị 20 nke ọnwa Nọvemba afọ 2022 na mba Qatar. Otu bọọlụ Naịjirịa bụ 'Super Eagles' etozughị iso n'asọmpi a mana ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa ga-eso gbaara mba ha dị icheiche. Lee ụfọdụ n'ime ha: Bukayo Saka, dị afọ 21, na-agbara otu bọọlụ Arsenal nke mba Briten. Nne na nna ya bụ Adenike na Yomi Saka bụ ndị Naịjirịa, mana ha mụrụ Bukayo n'obodo Ealing, na mpaghara 'Greater London'. Saka nwetara nturuugo dịka nwa afọ mba England kacha gbaa bọọlụ nke ọma  n'afọ 2021. A na-atụ anya na Saka ga-achake ka kpakpando n'asọmpi Iko Mba ụwa nke a. Saka agaghị abụ nwa afọ Naịjirịa mbụ na-agbara mba England bọọlụ, ndị ọzọ gụnyere Fikayo Tomori (AC Milan), Tammy Abaraham (AS Roma), wdg. Noah Okafor na-agbara mba Switzerland nakwa otu egwu bọọlụ Red Bull Salzburg nke mba Austria. Ọ dị afọ 22. Ọ gbakwaarala oggogo U15, U17, na U19 nke mba Switzerland. Nna ya bụ onye Igbo ebe nne ya bụ onye Switzerland. Okafor agbaarala mba Switzerland bọọlụ ugboro asatọ ma nye otu goolu. Akanji na-agbara mba Switzerland, bụ ebe a mụrụ ya n'afọ 1995. Nwa okorobịa a dị afọ 27 ugbua na-agbara otu bọọlụ Manchester City nke mba England. Nna ya bụ onye Naịjirịa ebe nne ya bụ onye mba Switzerland. Ọ gbaara mba Switzerland bọọlụ ugboro 42 ma nye otu goolu dịka ọ bụ onye na-agba azụ. Otu ihe ọzọ pụrụ iche na ndụ Akanji bụ na isi ya na-aghọ nkọ na mgbakọ na mwepụ, maọbụ 'arithmetic' na bekee. Nne na nna Ike Ugbo bụ ndị Naịjirịa, a mụrụ ya na mba England, mana ọ na-gabara mba Canada bọọlụ, bụ ebe ọ nọrọ too. Ike Ugbo gbaara mba England n'ogoogo nke U17 na U20, tupu ọ họrọ mba Canada. Ọ gbaarala otu bọọlụ Chelsea (England); Genk (Belgium); na Troyes (France) bụ ebe ọ nọ ugbua. N'ọnwa Septemba afọ 2021, Ike Ugbo kwuru na ya ahọrọla ịgbara Naịjirịa bọọlụ, mana ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya mgbe ọ tụgharịrị ma kwuo na ọ bụ Canada ka ọ ga-agbara bọọlụ. Nna Karim Adeyemi bụ onye Naịjiria, nne ya bụ onye mba Romania, mana a mụrụ ya n'obodo Munich nke mba Germany. Adeyemi na-agbara mba Germany bọọlụ, n'agbanyeghị na o nwere ikiki ịgbara Naịjirịa maọbụ Romania ma ọ bụrụ na ọ chọrọ. Ka ọ dị ugbua, Adeyemi na-agbara otu Red Bull Salzburg dị na mba Austria. Ọ dị afọ 20. Ọ bụ ezie na nne na nna Samuel Adekugbe mụrụ ya na mba England, ọ bụ mba Canada ka ọ họọrọ ịgbara bọọlụ. Adekugbe na-agbara otu bọọlụ Hatayspor nke mba Turkey; ọ na-agba azụ. Ọ gbaarala mba Canada n'ogoogo U-18 na U-20. https://www.bbc.com/igbo/articles/c516880qr1jo +health Toilet Infection: I nwereike ịbute ọkọ maọbụ ọrịa site n'ụlọmposi? "Mgbe ọbụla ị gafere n'ahịa, ị ga-anụ ebe ndị na-ere ọgwụ mgbọrọgwu na-ekwu okwu ịgwọ ọrịa a sị na-esi n'ụlọ mposi a kpọrọ a kpọrọ 'toilet infection'. Dịka ha si akọwa, ọrịa a metụtara ọrịa niile gụnyere ọkọ, isi ọjọ, ụfụ ma ọrịa ịnyụ mamịrị na ihe ndị ọzọ. Ihe ọzọ a na-echekwa bụ na ọ bụ naanị ụmụnwaanyị na-ebutekaarị ọrị a. Mana ọ bụ eziokwu na ọ bụ n'ụlọmposi ka e si ebute ọrịa ndị a? Anyị jụrụ otu dọkịnta pụrụiche bụ 'Gynaecologist' na Bekee maka nke a. Gụrụ gawa ka ị hụ ihe ndị dị mkpa ọ kọwaara. Dọkịnta Akinde Joseph kwuru hoo haa na o nweghi ihe dị ka 'toilet disease' a na-ebute n'ụlọmposi. Ọ kọwara na ọrịa ahụ bụ 'vaginal candidiasis' nakwa nje na-akpata ya bi n'akụkụ ike mmadụ bụ 'genital tract' na Bekee. O kwuru sị ""ndị mmadụ na-akpọ ya aha a n'ihi na ha cheere na ọ bụ n'ụlọmposi ka ha na-ebute ụdịrị ọrịa a"". Akinde Joseph kwuru na ọtụ na ike nwaanyị nọketere onwe ha nso nke mere na ọ bụrụ na nwaanyị akpachaghị anya debe onwe ya ọcha, ọ ga-adị mfe ka nje ahụ si n'ime ike fere n'ime ọtụ nwaanyị. Ọ kọwara na ọ bụrụ na nje ahụ buru n'ime ike ebe o kwesiri ị nọ, ọ gaghị enye nsogbu ọbụla mana ọ banye n'ọtụ, ọ ghọọ ọrịa. Ihe ọzọ tụrụ n'anya Dọkịnta Akinde kwuru bụ na nwoke nwereike ị sị na mmekọ nwoke na nwaanyị bute ọrịa a. Ọ sị ""ọ bụrụ na nwoke zutere nwaanyị bu ọrịa ahụ, o ga-ebute ya bụ ọrịa. O nwekwara ike ibunye nwaanyị ọzọ site n'ụzọ mmekọ"" Nke a pụtara na ọrịa a bụ vagina candidiasis nwereike iso n'ọrịa 'Sexually Transmitted Infections' mana ụzọ nke ya pụrụiche. Ndị ọrụ ahụike kọwara na ọ ga-ara ezigbo ahụ tupu mmadụ ebute ọrịa ndị a dị aṅaa. Nnyocha sanyesị gosiri na nje ndị na-akpalite ọrịa ndị a n’ahụ ndị mmadụ anaghị enwe ike dị ndụ maọbụ dị ire ma ha ebighi n’ime ahụ mmadụ. Nke a pụtara na nje ndị a agaghị enweike dị ndị mmadụ kpalitere mmadụ ọrịa site n’ụlọipo nsi n’ihi na ọ bụ site na mmekọ ahụ na ahụ ka ha na-esi awụfụ n’ahụ otu onye ma wụba n’ahụ onye ọzọ. Agbanyeghị nke a, mmadụ nwereike ibute ọrịa  ‘trichomoniasis’ site n’oche ụlọipo nsi mana ọ bụ naanị ma onye ọzọ nọrọ n’oche ahụ ngwa ngwa onye bụ ọrịa a si n’oche ahụ pụọ. Mmadụ nwekwaraike ibute ọrịa Hepatitis B site n’oche ụlọipo mana ọ bụ naanị ma ọ bụrụ na onye nọrọ n’oche ahụ nwere ọnya maọbụ apa mepere emepee. Nke a ga-adị ere naanị ọ bụrụ na onye nọbu n’elu oche ahụ gbaa ọbara ọhụrụ maọbụ nyụsa uhe n’elu ya bụ oche nke metụtara ya bụ ọnya mepere emepee. Tupu e kwuo okwu ọgwụgwọ, Akinde nyere ndị mmadụ ndụmọdụ ịgba mbọ debe onwe ha ọcha. ""Ị debe ebe ahụ ọcha bụ naanị ihe kachasị mma ga-egbo nsogbu ibute ọrịa a"" ka o kwuru. A bịazie n'okwu ọgwụgwọ, ọ kwuru na ọ dị mkpa ka ndị mmadụ gaa n'ụlọogwụ, nyochaa onwe ha ọfụma ma ṅụchaa ọgwụ niile e nyere ha. ""Ndị mmadụ na-emekaarị ha nwete ọgwụ ṅụọ ya abalị abụọ, ọrịa mee ka ọ lawala, ha akwụsị ịṅụ ọgwụ"" Ọ kọwara na agwa a jogburu onwe ya n'ihi na nje butere ọrịa ahụ ka dị ndụ na-enye nsogbu. O kwukwara na agwọghị ọrịa a ọfụma ga-eme ka ọ dịrịzịa ka ọrịa ala ala mana o kwesighi ị dị etu ahụ." https://www.bbc.com/igbo/articles/c2qn6540pwlo +politics Brexit Deal: Theresa May agbalahụla nchụda dịka onyeisiala "Akụkọ dị mkpa: Brexit Deal: Theresa May agbalahụla nchụda dịka onyeisiala Ndọrọndọrọ ma Theresa May ọ ga-aga n'ihu ịrụ dịka onyeisiala mba Briten bere n'abalị Wenezde dịka ndị omeiwu mmadụ 325 tụnyere ya ka ọ nọrọ ,ebe mmadụ 306 kwuru ka o rituo. Ndọrọndọọ ahụ bidoro ụbọchị Tuzde oge ọtụtụ ndị omeiwu mba tụrụ vootu megide Briten ịpụ na European Union. Ndị ụlomeiwu mba Briten mmadụ 202 kwenyere ka ha pụọ , ebe mmadụ 432 jụrụ. Onye ndu otu Labour pati n'ụlọomewu bụ Jeremy Corbyn welitere okwu 'enweghị ntụkwasaobi' na Theresa May, nke nwere ike kpalite okwu ntuliaka na oge na adịghị anya. Corby ibinye aka na vootu 'eenweghị ntụkwasaobi' ga-enye ụlọomeiwu ohere inwe mkpebi maka 'amaghị ọrụ' nke ọchịchị May. Theresa May kwuru na na ya ga-ewepụta ohere maka ndọrịtaụka n'okwu a akpụ n'ọnụ. Mohammed Adamu ebidola ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii Naijiria Mohammed Adamu amalitela ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii Naijiria dịka onyeisiala Naijiria tunyechara(decorated) ya ugo pụrụ iche. Ibrahim Idris onye bụbu onyeisi ndị uweojii Naijiria lara ezumike taa bụ Tuzde, abali iri na ise nke ọnwa Jenuwarị afọ 2019 ka ọ nọzuru oge ya n'ọrụ oyibo dịka iwu Naịjirịa si kwuo. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Jimoh Moshood kwuru na onyeisiala bụ Muhammadu Buhari enyela iwu ka Mohammed Adamu bu osote onyeisi nji uweojii bido na-arụ dịka onyeisi ha. Idris kelere onyeisiala nakwa ụmụ Naijiria maka nkwado ha. Mohammed Adamu bụ onye Lafia dị na Nasarawa steeti banyere ọrụ uweojii dịka 'Cadet"" n'afọ 1986 ebe o siri were gbalite n'ọkwa oosote onyeisi ndị uweojii. Ọ gara onye garala ọtụtụ ọzụzụ ndị uwe ojii na Najiria na mba ofesi rụụ ��rụ dịka onyeisi ndị uweojii nke Ekiti nakwa Enugwu steeti. A wakpola otu ụlọ oriri na nkwari n'isi obodo Kenya bụ Nairobi. Ihe ruru ogbunigwe abụọ gbara n'ebe ahụ ebe a nụkwara ụda egbe n'ebe ahụ dị n'akụkụ Westland ebe e nwere ụlọọrụ ndị mmaọ̄ụ nakwa ụlọ oriri na nkwari. Ndi hụrụ ka ihe a mere kwuru na ha hụrụ mmadụ anọ bu ngwaagha ebe ha na-aba ụlọ ahụ ebe ha gbara ọtụtụ ụgbọala ọkụ. A na-akpọpụta nd mmaọ̄ụ n'ime ụlọ ahụ dịka ndị uweojii gbochiri ebe ahụ ma na-agba mbọ ịgbapụta ndị tọrọ n'ime ụlọ ahụ. A mabeghi ndị mere ihe a. Ụgbọala isii nke ndị otu pati PDP gụnyere Sienna bus atọ na Coaster bus atọ nke ebiri ọkọlọtọ ndị PDP ma dọta ya n'otu ụlọ dị n'Osadebe streetị Ogui New Layout, na ncherita ihu WTC Enugwu. Dịka onye n'ekwuchitere ndị uwe ojii ọnụ ha n'Enugwu bụ Ebere Amarizu siri kwuo onweghị onye mara ka ya bụ ọkụ siri malite ma gbapịa ụgbọala ndị ahụ.Amarizu kwuru na ọ bụ enyemaka ngwangwa ndị uwe ojii nakwa ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ bụ Fire Service mere na ya bụ nnukwu ọkụ abaghị n'ụlọ gbara ogige ahụ gburu gburu. O sikwa na otu aka ahụ rịọ ndị mmadụ ka ha mara na ugbua bụ oge ọkụ ọgbụgba ji akpa ike, n'ihi ya onye ọbụla kwesiri igbochi ụzọ ọbụla ọkụ nwere ike iji ghọrọ ụlọ ma ọ bụ ngwongwo. Ana m akwado mmeri PDP na ntuliaka 2019. Ike Ekweremadu bụ onye ana ebo ebubo na uche ya adịghịzi na PDP kwuru nke a ụbọchị Monde mgbe okwuru na ya na Peter Obi na ndị gọọvamọ ọwụwaanyụ enwela ọtụtụ nzụkọ maka nke a. Idris gbara afọ iri isii taa nke bụ na o kwesiri ịla ezumike nka mana kepukepu na-ekwu na gọọmenti etiti nwere ike ịgbatikwu oge ya. Independent Electoral Commission INEC ekwuola na ụbọchị ikpeazụ aga akwụsi ịnye akwụkwọ ikike eji eme ntuliaka bụ PVC bụ na mkpụrụ ụbọchị asatọ (8) nke Febuwari. N'aka ọzọ INEC ewuchiela ekwentị maọbụ ihe ọbụal eji ese foto na ebe ana atụ vootu dika onyeisioche ha na Kano steeti bụ Okamuta Riskuwa Shehu si kwuo. Ụwaagbaa""Theresa"" gharịị maka Brexit N'ofesi, oruola ka aga amata ebe ọsụ ụtara dowere ọdụ na amụma Brexit nke mba Briten. Theresa May bụ onyeisi obodo ahụ na-arịọ ndị pati ya ha ekwela ka ihere mee ha site na-ịme ka ya bụ Brexit kpụọ afọ n'ala. Agụ nwaanyị tenis bụ Serena Williams egosila na ya bụ agadị anaghị aka nka na egwu ọmaara agba sịte na-imeri Tatjana Maria na Australia Open. Serena gbara afọ iri atọ na asaa ga-enweta nturu ugo grand slam nke iri abụọ na anọ (24) ma ọ nweta mmeri nke agba abụọ a ọ banyere." https://www.bbc.com/igbo/media-46860958 +health Coronavirus: Ndụmọdụ ụmụ afọ Igbo nọ Chaịna na-enye ndị Naịjirịa maka nje a A na-ekwu na ọ bụ Chaina ka coronavirus si, ma na-ekwukwa na ọ bụ mba ahụ kachasi mara etu e si ebuso ha bụ nje agha. Ụmụafọ Igbo abụọ na-agụ mahadum na mba ahụ kowara ihe ha hụrụ ma nyekwa ndị nọ Naịjirịa ndụmọdụ etu ha ga-ejiri mgbochie mbanwanye nje a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52171532 +sports Liverpool F.C: 2020 ọ ga-abụ afọ ha ga-emecha metụ iko Premier League aka? Ọ dị ka afọ 2020 a ga-abụ afọ Liverpool ga-emechi ndị na-akọ ha ọnụ maka ebuteghi iko Premier League. Ọ bụrụ na a mụrụ gị n'ihe dị ka site n'afọ 1989/90 ruo ugbua, mara na gị na mgbe ikpeazụ Liverpool metụrụ iko Premier League aka, bụ ọgbọ. Gịnị ka nke a pụtara? Ọ pụtara na ikpeazụ otu egwuregwu a buliri iko a, bụ afọ iri atọ gara aga (1989/90). Ka a kwụ ugbua na tebulu Premier League, Liverpool chị ezigbo ọkụ bịa n'afọ 2019/2020 a, makana ha emeriela egwuregwu 19 n'ime 20 ha gbarala. Ebe ọ fọrọ egwuregwu 18 tupu afọ a emechie, ha mere etu a na-aga n'ihu, enweghị ihe ga-egbochi aka ha ibuli iko a. Ha enwetala pọịntị 58, ebe ndị na-eso ha n'azụ bụ Leicester City nwere pọịntị 45; nke bụ na ọ bụ pọịntị 13 ka Liverpool ji aga ha. Ọ bụrụ n'ajụjụ a na-anụ gị ọkụ n'obi, i fughi ụzọ, n'ihi na ọ bụkwa ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ gbasara ihe mere na Liverpool ebutebeghi iko a. Mana ọ bụ na ha erubeghi nso imetụ ya aka? Ha agbalịala ibute ya bụ iko, mana iko ahụ na-eme ha ọnọ nso eru aka. Ugboro ole ha ruru nso ibute iko Premier League Ugboro ugboro ka Liverpool ruru nso imetụ iko a aka, nke kacha nso abụrụ n'afọ 2018/2019 mgbe Manchester City ji naanị otu pọịntị gafee ma pụchara iko ahụ n'ụbọchị ikpeazụ a pịachiri asọmpi Premier League nke afọ ahụ. Ha ruru nso imetụ iko a aka n'afọ 2013/2014, mgbe Manchester City napụkwara ha nri n'ọnụ. N'afọ 2001/2002, ha ruru nso ibute iko a, mana Arsenal buliri ya bụ iko ebe Liverpool gbara ndị nke abụọ. Otu ihe ahụ mekwara n'afọ 2008/2009, mgbe Manchester United ji naanị pọịntị anọ gafee ha ma bulie iko. N'afọ 1990/1991 ka ha rukwara nso ọzọ ka ha mabutechara ya bụ iko n'afọ 1989/90, mana Arsenal bụ ndị bu Iko ahụ laa. Na ha ebutebeghi iko abụghịkwanụ na ha gba aka iko n'ime afọ iri atọ a (site n'afọ 1990 ruo 2019). Lee ndị ha butenwuru: Ihe nkiri a ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50976255 +health Coronavirus: Mmadụ 22 enyochara ebughi ọrịa ahụ na Naịjirịa - NCDC "NCDC ekwuola na n'ime mmadụ 23 e mere nyocha na o nweghi onye ọzọ bu ọrịa Coronavirus na Naịjirịa n'abụghị nwoke onye bu ya mbụ. Nke a na-abịa dịka ha lebara anya n'ahụ mmadụ 22 ọzọ si na steeti ise na Naịjirịa gụnyere Legọs, Ogun, Abuja, Kano nakwa Edo. Ha kwuputara site n'akara Twitter ha na ""o nweghi onye ọhụrụ ọzọ bụ Coronavirus"" Mba Ịtali etinyela mmadụ nde iri na isii n'ọnọdụ Bekee kpọrọ ""quarantine"" dịka ọ na-ebuso nje coronavirus agha ịhụ na ha chabiri mbawanye ya. Ndị o metụtara bụ ndị bi na mpaghara Lombadi nakwa mpaghara 14 ọzọ. Ndị a niile ga-anata akwụkwọ pụrụiche tupu e nye ha ohere ka ha mee nje ọbụla. Obodo Milan an Venice so n'ebe ya bụ ihe metụtara. Onyeisiala Ịtali bụ Giuseppe Conte kwukwara na ha amachiela ndị mmadu ịga ụlọakwukwọ, ebe oriri na nkwari nakwa ebe njem nkiri di na mba ahụ dum. Ọ bụ n'ụbọchị nke atọ nke ọnwa Eprelu ka mmachị ndị a ga-akwụsị. Mba Ịtali b ya kacha nwee ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus na Yurope. Ndị ọchịchị kwuru na ndị bu nje a na-abawanye kwa ụbọchị. Ugbua, ihe ruru mmadụ 5,883 bu ọrịa coronavirus na Ịtali ebe mmadụ 230 anwụọla. Gịnị mere Gọvanọ Hope Uzodinma? Akụkọ na-efegharị na-akọwa na a wakpoola ụgbọala Gọvanọ na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma na steeti ahụ. Ụlọ ntaakụkọ dị icheiche kwuru na ọ bụ ndị ntorobịa Ohaji - Egbema wakporo Uzodinma ma na-ati ""Onye oshi vootu"" Ebe akụkọ ọzọ na-ekwu na ndị ntorobịa na ndị agha lụrụ ọgụ nke butere mmebi enyo ụgbọala Gọvanọ Uzodinma. Ka ọ dị ugbua BBC Igbo na-agba mbọ ịchọpụta nke bụ eziokwu n'akụkọ a. N'egwuregwu, Chelsea ji ọkpụ goolu anọ asataghị otu yọchaa Everton ka akamụ ndụ mgbe ha zutere onwe ha n'asọmpị Premier Lig n'ụbọchị ụka. Nke a na-abụ ugboro abụọ Lampard onye nchịkọta Chelsea na-emeri ndị nkuzi ya bụ Ancelotti na Mourinho. Coronavirus metụtakwara egwuregwu na mba Ịtali. Ndị nhazi egwuregwu kagburu asọmpi niile gaara adị n'izuụka gara aga n'ihi ya bụ ọrịa. Etu ahụ ka ọ dịkwa n'egwuregwu bọọlụ nkata na ndị ọzọ. Mana ha enyela iwu ugbua ka asọmpi ndị ahụ gaa n'ihu, kama onweghị ndị mmadụ ga-abịa ikiri ya. Ọkammụta n'ihe gbasara nnyocha nje bụ Oyewale Tomori ekwuola na onye ọbụla sị na ya nwere ọgwụ maka coronavirus n'Africa bụ okpotokpo asị ka ọ na-asị. Tomori onye bụbu onyeisi mahadum Redeemers dị n'Osun steeti kwuru nke a dịka akụkọ na-agbasa ebe ụfọdị ndị mmadụ na-ekwu na ha nwere ọgwụgwọ maka ọrịa a. O kwuru na ọ bụrụ na e nwere mba ga-ewepụta ọgwụ coronanavirus, o kwesịrị ịbụ mba Chaịna ebe ya bụ ọrịa nọrọla ọtụtụ oge. Tomori jụrụ sị, ""kedu ka mmadụ ga-esi kwuo na ya nwere ọgwụ maka ọrịa batara Afrịka n'otu izuụka gara aga?"" ""Tupu mmadu ekwuo na ọgwụ na-agwọ ihe, ọ ga-egosi anyị onye o ji ọgwụ ahụ gwọọ."" ""Ndị kwuru na ha nwere ọgwụ coronavirus, mmadụ ole na-arịa ọrịa a ka ha gwọrọla?"" Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-51788459 +sports Real Madrid vs Barcelona: Real Madrid tara Barcelona ka atụ ụtụtụ Real Madrid ji ọkpụ goolu abụọ a na-asaghị asa chaa chaa wee gwọọ Barcelona ịba ka ha zutere n'ọgbọegwuregwu Santiago Bernabeu. Goolu abụọ ahụ si n'aka Vinicius Junior na nkeji 71 na nke Mariano Diaz nyere na nkeji 90+2 zuru ịgbawa ndị Barcelona chere na ha ga-enweta mmeri gaara eme ya nke ise ha na-emeri ha n'ime nzukọ isii ikpeazụ ha. Mmeri a Real meriri n'El Clasico a mere ka ha wụfere n'elu tebulu La Liga, ma bụrụ ndị mbụ na tebulu ahụ, dịka ha ji otu pọịntị aga Barcelona na-eso ha n'azụ. Ndị mmadụ gara na Twitter na-ekwu etu egwuregwu a si gaa, ma kwuo na Lionel Messi bụ onye egwu aha ya na-ada ụda si fuo. Ha kwuru etu Marcelo si kechie ya n'ime akpa ma ghara inye ya ohere ime ihe e ji mara ya. Lee ụfọdụ ihe ha kwuru: Ọzọ bụ na ha kwuru etu ọbịbịa Cristiano Ronaldo bịara ile bọọlụ n'ọgbọegwuregwu ahụ so gbaa ndị Real Madrid ume mere ha ji kara obi gwọọ Barcelona ara. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasịkwa gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51665158 +health Coronavirus Tips: Anwụnta anaghị ebufe mmadụ coronavirus Akụkọ na-ekwu na anwụnta nwere ike ikesa ọrịa coronavirus bụ okpotokpo asị. Otu 'World Health Organisation' ekwuola nke a komkom hoohaa. Etu coronavirus si efesa bụ site n'ụkwara, uzere maọbụ azụzụ onye nwere ya bụ ọrịa. Nke kpatara o ji dị mkpa ka ị nọtee onye na-akwa ụkwara aka. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Chioma Obianinwa, Chukwunaeme Obiejesi na Nnamdi Agbanelo https://www.bbc.com/igbo/media-52317852 +business Ọnọdụ anyị ebe a dị ka ọnọdụ ụmụnne anyị na South Africa - Ndị Naịjirịa na-azụ ahịa na Ghana Kizito Obiora bụ onyeisi ndị Naịjirịa na-atụ mgbere na Kumasi. Ọ gwara BBC na o teela ndị Naịjirịa na-atụ mgbere na Gana na-ahụsị anya na njem ịtụ mgbere na mba ahụ. Ọ kwuru na iwu mba Gana wepụtara maka ndị oji ego achụ ego si mba ọzọ bụ ihe mmekpa ahụ. Mana, ndị Gana na-ekwu na ọ bụghị eziokwu. Ha kọwara na ha anaghị achụ ndị Naịjirịa, na ọ bụ ihe iwu obodo ha kwuru ka ha na-eso. Uche ha bụ ka ndị Naịjirịa ghara iso ha na-atụ mgbere nke ịrepụ obere obere dịka iwu kwuru. Ndị Naịjirịa na onwe ha si na nke a ga-esiri ha ike maka etu ọnọdụ mgbere si dị na mba ahu. Lee akụkọ a n'uju. Ọrụ a si n'aka Chiemela Mgbeahuru na Chimamaka Ihenacho. https://www.bbc.com/igbo/afirika-49852029 +politics APC na-aṅụrị maka ntuliaka emere ụnyaahụ Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Ka anyị bido na ụfọdụ ntulika emere na steeti dị iche iche ụnyaahụ: Na Katsina, Maazi Ahmad Babba-Kaita bụ onye zọọrọ ndọrọndọrọ ọchịchị n'okpuru APC meriri nwanneya nwoke bụ Kabir Babba-Kaita bụ onye PDP na mmegharị ntuliaka iji nwete onye ga-anọchịte anya Sịnetọ Mustapha Bukar nwụrụ n'ọnwa Epreelu nke afọ a. Ahmad nwetere vote karịrị puku nari iri abụo na anọ 224,607, ka Kabir, bu onye toro ya, nwetere vootu ji obele karia puku iri ise na itoolu APC jiri twitter kele Ahmad. Na Bauchi Ndị APC na-ekwukwa na ọ bụ ha meriri ntulika nke a ga-eji nwete onye ga-anọchite anya Sịnetọ Ali Wakil nwụru n'ọnwa maach nke afọ a. Ọnụ ọgụgụ vootu gosiri na Lawal Yahaya Gumau nke APC nọ n'ihu. Yabụrụ na ihe ka dị etu a, ọ ga-egosi na gọvanọ chịbụrụ steeti ahụ bụ Isa Yaguda achịtaghị aja na ya bu ntulika. Yaguda zọrọ ọchịchị a n'okpuru otu pati GNP. Ebe ọzọ emere ntuliaka bụ Kogi steeti na Cross River steeti. Na Mba Ofesi ndị uweojii na Kanada akpụpụla otu nwoke ụlọikpe maka ogbugbu mmadụ anọ, nke mmadụ abụọ n'ime ha bụ ndị uweojii. Oweojii si na Mathew Vincent Raymond dị afọ iri anọ na asaa gbụrụ ndị a obodo Fredericton nwanne ụnyaahụ. N'egwuregwu, Otu goolu nwaafọ Naịjirịa bụ William Troosk-Ekong nyere ezughi inyere Bursapor aka imeri Fenerbache. Feneerbache mechara asata ọkpụ gọọlụ abụọ jiri nwete mmeri. Asọmpị ahụ bụ nke bụ nwaafọ ghana bụ Andrew Ayew ga-agbara Fenerbache mana ọchitaghị aja tupu ewepụya. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa: https://www.bbc.com/igbo/afirika-45160502 +health Health tips: Ịgụ egwu ọ ga-enyerenwu ọnọdụ ahụike gị aka? "Ịgụ egwu ga-akpalitenwu mmụọ anyị, mana nchọpụta ekwuola na o nwekwara ike inyere ọnọdụ ahụike anyị aka. O nwekwara ike inyere nkuru ume onye akpaume na-enye nsogbu aka, ma nyerekwa onye nwere ọrịa nchefu a na-akpọ ""dementia"" aka idi ọrịa na-arịa ha. N'ime ihe ruru afọ iri abụọ gara aga, ndị nnyocha agbaala mbọ ịchọpụta ihe a ga-ejide aka sị na ọ bụ akparamagwa maọbụ eburupụtaụwa ahụ jikọrọ egwu na ahụike. Ọkammụta Daisy Fancourt, si na mahadum University College London, kwuru sị na ọtụtụ ihe na-agbanwe n'ahụ mmadụ ma ọ na-agụ egwu: ""Nke a nwereike ịgụnye mbutu n'ihe na-ebute mgbakasị ahụ, nke a kpọrọ cortisol. Anyị na-ahụkwa ihe dị iche n'ọnọdụ endorphin nke na-emetụta mgbanwe ọnọdụ anyị."" Ọkammụta Fancourt emeela nnyocha dị iche iche gbasara uru ịgụ egwu bara, ma kwuo na ọ bara uru dị iche iche. ""Ịgụ egwu bụ ihe e ji enyere ọnọdụ ahụike dị iche iche. Ọtụtụ ihe mejuputara ịgụ egwu. Ịgụ egwu gụnyere igosiputa ihe na-aga gị n'uche, nke anyị ma dịrị ọnọdụ ahụike ụbụrụisi mma. Ọ na-enyekwa aka izi mmekọrịta nwereike iwebilata ọnọdụ mmadụ iche na ọ bụ naanị ya kwụ."" O kwuru na ige egwu nwere ọtụtụ uru ọ baara ahụike. ""N'ime ndị na-aga emume ebe a na-agba egwu, n'agbanyeghi maọbụ egwu tara nchara maọbụ nke 'rock' - anyị chọpụtara na o buturu ọnọdụ mgbakasị ahụ. Nke a gosiri na ọ na-arụ ihe dị iche iche."" Akwụkwọ ndị Canterbury Christ Church University, UK, wepụtara gosiri na ""Ịgụ egwu nwereike inyere ndị nwere ọrịa ụbụrụ na ọrịa ndị ọzọ dị iche iche aka"". Ndị nnyocha tinyekwuru sị ""ịgụkọ egwu n'ọgbakọ karịrị otu onye nwere ọtụtụ uru ọ bara n'inyere aka na mgbake ndị nwere ọrịa ụbụrụ"". Annabel bụ okwe ukwe bi na mba Jamini, kwuru ihe ịgụ egwu mere n'uche nakwa ahụ ya. ""Mgbe ọbụla m na-agụ egwu, ọ na-adị m ka oge ntụgharị uche. M na-etinye onwe m n'ime egwu ahụ. Ọ na-eme ka ahụ dị m mma."" Ọ na-eji awa atọ agụ egwu kwa ụbọchị Tọzde ọbụla. ""Ị na-eji ahụ gị niile agụ egwu. Nke a bụ ihe m na-ekwu mere na anaghị m aga n'ụlọ mmegharị ahụ."" Ọrịa nchefu (Dementia) A na-eji abụ nakwa ịgụ egwu dịka otu usoro e ji enyere ndị na-arịa ọrịa dementia aka. ""Mgbe anyị na-agụ egwu, e nwere akụkụ ụbụrụ anyị ọbara na-aka agaru - akụkụ ndị a na-akpọ precortical - ha bụ ndị nke na-afọkarị n'ụbụrụ onye na-arịa dementia mgbe ọrịa ahụ kpụrụchara akụkụ ndị ọzọ. Ebe ahụ bụ ebe ndị metụtara etu ihe si emetụta mmadụ,"" ka Dkt. Simon Opher kwuru. Dkt Opher si obodo Cheltenham dị n'Ịngland, kwuru sị na ige egwu ""na-akpọte ndị na-arịa dementia ma mee ka uche ha dịrị n'ihe a na-eme."" Mind Song bụ ụlọọrụ efu dị na mba Briten na-eziga ndị ọgụ egwu ha ka ha gaa n'ụlọ ebe a na-elekọta ndị merela agadị, ka ha nwee ike ikpalite mmụọ ndị agadị ahụ ka ha nwee ike na-agụ egwu. ""E nwere uru ndị ị ga-erite site n'iso ndị mmadụ gụọ egwu. Ọtụtụ ndị na-elekọta ndị agadị na-agwa anyị na ha na-anọ n'ọnọdụ obi aṅụrị ruo echi ya,"" ka Maggie Grady, onye na-ahazi iji egwu agwọ ọrịa nke ngalaba a kwuru. Mind Song na-ahazikwa nkuzi egwu maka ndị na-arịa ọrịa akpaume site n'asthma ruo kansa nke akpaume. ""Ha bịachaa mmụta ihe ruru ugboro ise maọbụ isii, ụfọdụ ndị anyị na-akuziri na-agbaketu."" Ule a na-akpọ ""Peak flow"" na-egosi etu ikuku ga-esinwu n'akpaume kupute ọsịsọ - nke bụ otu ụzọ e si ama ndị iku ume na-ara ahụ. Ọ bụghịzị ihe ịtụnanya na ndị ọrịa akpaume na-enye oke nsogbu na-eji ịgụ egwu enyere ọnọdụ ha aka. Colin na-arịa ọrịa a kpọrọ ""idiopathic pulmonary fibrosis"", bụ ọrịa na-enweghi ọgwụgwọ ma na-egbu ndị na-arịa ya n'ime afọ atọ. Mana n'agbanyeghi etu ọrịa ahụ si jọọ oke njọ, o kwuru na ịgụ egwu na-enyere ọnọdụ ya aka. ""Mụ na ihe ruru mmadụ 16 na-agụ egwu. O nyerela m aka ikuzi ume karịa etu m si emebu. M na-eme nnyocha maka ọnọdụ akpaume m oge ọbụla ma chọpụta na o mewela ọfụma."" Ịgụ egwu na-eme ka ahụ nyụpụta endorphins, bụ nke na-eweta obi ụtọ. Ịgụ egwu na-eme ka anyị kuba ume, nke na-akwalite mgbasa ọbara n'ahụ ma na-ewelite ọrụ endorphins na-arụ. Ọ dị ka etu endorphin si agbagharị n'ahụ ma anyị chịa ọchị maọbụ rie chọkọleti. Otu nnyocha gosiri na ị soro ndị mmadụ gụkọọ egwu ihe ruru nkeji 40, na cortisol - bụ mmiri ọgwụ mgbakasị ahụ - na-ada ọsisọ karịa etu ọ gaara ị na-eme. Ogo cortisol anyị na-eru na-ada n'ebe ngwụcha ụbọchị, mana ịgụ egwu na-enyere ya aka ịgasi ike. Nchọpụta gosiri na ndị na-agụ egwu na kwaya na-aka amụpụta mmiri ọgwụ ahụ a kpọrọ oxytocin, bụ nke a na-akpọ ""mmiri ọgwụ ịhụnanya"" mgbe ụfọdụ. Anyị na-anyụpụta ya ma anyị makụọ, ọ na-emekwa ka ntụkwasị obi na mmekọ mmadụ na mmadụ mụbanye. Nke a nwereike ịkọwa ihe mere ndị na-agụkọ egwu na kwaya ji abụkarị ma na-anọkọkarị ọnụ ọtụtụ oge. Ịgụ egwu na-ebutekwa nnyụpụta dopamine, bụ otu ihe na-agwa ụbụrụ egwu. A ma ya dịka ihe na-ewepụta ""obi ụtọ"" ma ihe dịka iri nri maọbụ ịṅụ ọgwụ ike kpalie ya. Nnyụpụta ya na-adị ka nkwado nakwa mkpalite mmụọ. Ndị achọghị ịpụ n'ụlọ ha nwereike isonye ndị na-agụ egwu n'elu kọmputa, ha na-agbalị ime ka ọ dị ka ebe mmadụ so ọtụtụ ndị mmadụ nọ otu ebe na-agụ egwu. Atụmatụ a na-akpọbata ọgụ egwu ndị ọzọ si na mpaghara ụwa dị iche iche ma jiri teknụzụ jikọọ ha. Eric Whitacre bụ onye riterela nturuugo Grammy maka ide na ihazi egwu nwere otu kwaya nke a na-agụ n'elu ịntanetị. Ndị na-agụ egwu n'akukụ ụwa dị iche iche ga-agụ nke ha ma zibata ya, a hazie ya ọfụma ma mee ya ka ọ bụrụ otu nkwepụta. Ndị na-eme nnyocha na-akọwa na mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke isonye otu ndị na-ekwe egwu na-ebute nwekwara ike iwedata mmadụ ịnọrọ onwe ya. N'adịghị ka ụmụaka na-amalitekarị ịgụ egwu n'ụlọakwụkwọ, ọ na-ara ọtụtụ ndị okenye ahụ isonye otu egwu. MJ Paranzino kara ndị mmadụ obi were sị: ""Oge mbụ mmadụ na-agụ egwu na-adi ka ụbọchị mbụ mmadu malitere ọrụ. Ọ gagahị adịcha gị mfe,ị nwereike na-eme ihere. Ọ bụ ịka obi ka eji aga n'ihu. Mana, ewezụga ihere na ihe ndị ọzọ nọchiri gị n'ụzọ, ị ga-achọputa ọwa ọhụrụ mara ezigbote mma. Once you get over those inhibitions, you will discover an amazing new world,""" https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-53850187 +health Ụlọọgwụ ABSUTH n'Aba tọgbọ chakoo dịka gọọmentị ji ndịọrụ ahụike n'Abia ụgwọ ọnwa 18 "Nchọpụta BBC mere gosiri na ụlọọgwụ mahadum Abia steeti, a kpọrọ 'Abia State Teaching Hospital' tọgbọ chakoo n'ihi abụbụ ọrụ ndịọrụ ahụike. Otu jikọrọ ndịọrụ ahụike a kpọrọ ""Joint Health Workers Union"" (JOHESU) malitere abụbụ ọrụ n'abalị atọ nke ọnwa Nọvemba. Iwe ha bụ maka ụgwọọnwa ọnwa iri na asatọ (18 months) nke gọọmentị steeti ahụ ji ha, nakwa akwụghị ụgwọ ezumike nka nke ndị otu ha lara ezumike. Ha kwukwara na gọọmentị Abia steeti wepụrụ ndịọrụ ahụike n'atụmatụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ha wepụtara. Oge BBC Igbo gara Absuth, anyị chọpụtara na elu na ala tọgbọ chakoo ka ebe a gbara ọsọ agha. Naanị ndịọrụ nọ ebe ahụ bụ ndị nche olemole, nakwa ụfọdụ ndị ha na onyeisi ụlọọgwụ ahụ na-arụkọ ọrụ. Mana onyeisi ụlọọgwụ ahụ bụ Dọkịta Offia Awa Ukonye gwara BBC na ndị dọkịta agbaghị abụbụ ọrụ, kama ọ bụ sọ ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ. Dkt Ukonye kwukwara na onweghị ihe naanị ndị dọkịta nwere ike imenwu ma ọ bụrụ na ndịọrụ ahụike ndị ọzọ anọghị ya inyere ha aka. O kwuru sị: ""Oge abụbụ ọrụ ndị Johesu malitere, anyị hapụrụ ndị niile nọ n'ụlọọgwụ ka ha laa"". Ukonye kwukwara na ndị isi ụlọọgwụ Absuth nakwa Gọvanọ Okezie Ikpeazu na-enwe ọgbakọ kwa mgbe kwa mgbe iji weta ọnọdụ ahụ n'isi njedebe. ""Gọvanọ ekwetala ịkwụ ndịọrụ ahụ ụgwọ ọnwa isii ruo ọnwa itoolu,"" Ukonye kwuru. BBC chọpụtakwara na okporo ụzọ e si aga ụlọọgwụ ahụ jọgburu onwe ya na njọ. N'ụbọchị Tọzde, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Nọvemba, ka gọọmentị Abia steeti kwuru na ha ehibela kọmiti ga-eleba anya n'ụgwọọnwa niile gọọmentị ji ụfọdụ ndịọrụ steeti ahụ. Ndịọrụ gọọmentị ji ụgwọ gụnyere: N'akwụkwọ ozi si n'aka Onyebuchi Ememanka, bụ onyeisi mgbasa ozi Gọvanọ Ikpeazu, kọmiti a nwere izuụka abụọ iji rụọ ọrụ ha ma wetara gọvanọ mkpebi ha. Mana ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na ha enweghị ntụkwasị obi n'ebe kọmiti ahụ nọ, n'ihi na ndị niile so na ya bụkwa ndị gọvanọ Ikpeazụ họrọ n'ọrụ. Ndị mebere kọmiti a gụnyere:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-55112852 +politics Nigeria vs P&ID: Naịjirịa anatala ikike ikpegharị ikpe ya na ụlọọrụ P&ID Otu ọkaikpe na UK enyela Naịjirịa ikike ịgbagha ikpe e kpere nke sịrị ha kwụọ ụlọọrụ 'Process and Industrial Development' ego dị ijeri dọla itoolu na ụma isii. N'ikpe mbụ e kpere n'ọnwa Ọgọst sị na Naịjirịa ga-ahapụrụ ụlọọrụ a akụnaụba ndị ọnụ ego ya ruru ijeri dọla itoolu na ụma isii ($9.6bn). Mana n'ikpe nke a ọkaikpe na UK kpere n'ụbọchị Tọọzde 26 Ọgọst, 2019, ọ sị na Naịjirịa ga-agbanyụ ọkụ inye ụlọọrụ a akụnaụba ndị ahụ. Nke a nyere Naịjirịa ohere ikuru ume dịka ikpe a ga na-aga n'ihu n'etiti ha na ụlọọrụ P&ID. Ọkaikpe nyere iwu ka Naịjirịa kwụọ ụlọikpe a ego dị nde narị dọla abụọ ($200m) n'ime ụbọchị iri isii iji gbochie nkpachi akụnaụba ha. Cheta na Naịjirịa gara n'ụlọikpe dị na mba UK maka ime udo n'etiti ha na ụlọọrụ P&ID. Ndị so mee njem a gụnyere Okaiwu ukwu nke gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami, Mịnịsta mgbasa ozi bụ Lai Mohamed, na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu. Anambra steeti esorola na ndị mbụ wepụtara usoro mkpata na mmefu akụ bụ bọjet nke afọ 2020. Willie Obiano bụ onye bupụtara bọjet a n'ihu ndị ụlọomeiwu nke steeti ahụ sị na otu ijeri narị naịra, iri atọ na asaa ka ha ga-etinye n'ọrụ n'ime afọ 2020. Gọọmentị sị na isiokwu bọjet ahụ bụ maka nkwado ndị ntorobịa nakwa ịrụzi ihe eji enyere ndụ aka na steeti ahụ. Ha sị na pesenti 43 bụ ijeri Naịra 58.69 ga-aba n'ụgwọ ọnwa nakwa ihe ndị ọzọ na-eme ka ọrụ na-aga werewere. Ebe pesenti 57 bụ ijeri 78.3 ga-aba n'ọrụ ihe eji enyere ndụ aka dịka okporoụzọ, ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ na ihe ndị ọzọ. Obiano sị usoro mkpata na mmefu akụ a ga-enye aka ịkpọbata ndị oji ego achụ ego na steeti ahụ. Onyeisiala mba France bụ Jacques Chirac alaala mmụọ mgbe ọ gbara afọ iri asatọ na isii. Ọgọ ya nwoke bụ Frederic Salat-Baroux gwara ndị ntaakụkọ na Chirac lara n'udo. N'egwuregwu, Super Eagles nke Naịjirịa ahọpụtala ndị ga-eso s���ọ mpi enyi na enyi ha na mba Brazil n'ụbọchị 13 Ọktoba, 2019. Onye nkuzi Super Eagles bụ Gernot Rohr kpọrọ ha Alex Iwobi, William Troost Ekong na Samuel Chukwueze. Ndị ọzọ gụnyere Wilfred Ndidi na aha mmadụ iri abụọ ndị ọzọ ga-esọ ya bụ mpi na Singapọre. Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-49844980 +politics Lee etu APC ji were ọgụ gbasa ntuliaka ha n’Enugwu Ntụliaka ndị APC mere n'Enugwu bu ihe eji ọgu na mgba were me, nke mere ha jiri gawa ụlọikpe ịga mata onye ga-abụ onye ndu ha. Ihe onyonyo a gosiri etu ya bụ ntụlị aka siri ga. Cheta na APC bụ otu n'ime patị ndọrọndọrọ ọchịchị kachasi buo ibu na Naịjirịa. Onnyeisiala na-achị Naịjirịa ugbua jiri ọkọlọtọ APC bata ọchịchị. https://www.bbc.com/igbo/afirika-44279021 +politics Ipob na Ohaneze ekpeziela mana ọnweghị mgbe ha ji kwuo maka ọkwa onyeisila Naịjirịa Otu n'ime isiokwu pụtara n'ụtụtụ a bụ na Ohaneze ndị Igbo na ndị otu Indegenous People of Biafra (Ipob) ekwekọrịtala ịchụwa ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023. Mana nke a abụghị eziokwu ma ọlị. Mgbe BBC Igbo kọtụrụ Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimako ya na Onyeisi ndị Ohaneze ndị Igbo n'Anambra steeti bụ Damian Okeke-Ogene, ha abụọ kwuru otu olu na ya bụ okwu. Ha sị na ọ bụ n'ezie na Ipob na Ohaneze ekpeziela mana ọnweghị mgbe ha jiri kpaa maka ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ọgbakọ ha nwere izuụka gara aga. Ha abụọ kwuru na ya bụ mkparịtaụka anyị nweere ha iche iche n'ekwentị, na Ohaneze na Ipob nwere nkwekọrịta nke ha, na isiokwu ha bụgodi ịkpe udo n'ime ha, ọbụghị ọkwa onyeisiala Naịjirịa. https://www.bbc.com/igbo/afirika-53748659 +entertainment Yul Edochie Second Wife: 'Abụghị m onye mbụ nke m ga-eji abụ onye ikpeazụ - Judy Austin "Nwunye nke abụọ nke Yul Edochie, onye ejije a ma ama bụ Judy Austin Muoghalụ, ekwuola na ọ bụghị ya bụ onye mbụ a ga-alụ dịka nwaanyị nke abụọ, nke ya ga-eji abụ onye ikpeazụ. Nke a bụ mbụ ọ pụtara n'ọha kwuo okwu kemgbe Wenezde, izuụka gara aga bụ oge Yul Edochie kwupụtara n'ọha na ya lụrụ Judy bụ nne mụtaara ya ọmarịcha nwa nwoke dịka nwunye nke abụọ. Nkwupụta ahụ kpọtụrụ akpọtụ na soshal midia na Naijiria gbaa gburu gburu dịka ọtụtụ katọrọ Yul maka ịrapụta nwunye bụ ya bụ onye nọnyere ya oge o nwebeghị ihe ọ bụ. Ndị mmadụ takwara Judy bụkwa onye ejije na Nollywoodụta itinye isi n'ezinaụlọ nwaanyị ibe ya. . Mana n' ọsịsa o nyere n'ihe onyonyo o wepụtara n'akara Youtube nke Yul Edochie n'abalị mbụ nke ọnwa Mee, Judy kwuru na ""Abụghị onye mbụ nke m ga-eji abụ onye ikpeazụ."" Judy , onye kwuru na akụkọ ndụ ya dịka ihe nkiri nke onye nụrụ ya ga-agbanwe echiche ọjọọ o nwere megide ya tụrụ arịrị na ọtụtụ na-akatọ ya achọghị ige ntị nụrụ akụkọ nke ya onwe ya. ""Otutu mgbe na Naijiria , ndị mmadụ nụ akụkọ , ha anaghị eche ka ha nụ n'olu onye nke abụọ."" ""Anyị nile bụ mmadụ, o nweghị onye na-etete ụra sị na ya ga-emejọ mmadụ ibe ya."" ""Abụ m onye nwere afọ ọma, na-enwe aṅụrị , anaghị ekwe ka ihe ọbụla napụ m obiaṅụrị."" ""O nweghị ihe ọzọ nwere karịa ịhụnanya."" Na naijiria ịlụ ụbara nwaanyị bụ omenala mana iwu megidere onye gbara akwụkwọ n'ụlọikpe ịlụ nwaanyị nke abụọ. Iwu ndị ụka Kraosti megidekwara mmadụ ịlụ karịa otu nwaanyị. Ezigbo aha ya bụ Muoghalu Uchechukwu Judith. Ọ bụ onye ejije Nollywood, nke ya na Yul Edochie mekọrọla ejije mbụ. Ọ bụkwa onye mmepụta ejije nke Bekee kpọrọ producer; o mepụtala ejije a kpọrọ ""Native Girl"" nakwa ""Fear"". Ọ malitere ime ejije n'afọ 2013. Ọ bụ onye Anambara steeti. A mụrụ ya n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba. Ọ gara mahadum na Nnamdi Azikwe University, Awka. Na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Vanguard nwere n'afọ 2020, Judy kwuru sị na ọ naghị ""ahụ alụmdinanwunye dịka ihe mmadụ ji etozu oke"". Nwanne Yul Edochie bụ Uche Edochie agbaala ama na ezinaụlọ ha dọrọ nwanne ha nwoke aka na ntị ka ọ ghara ịlụ nwaanyị nke abụọ mana ọ kpọchiri ntị gaa lụọ ya. Cheta na akụkọ na Yul luru nwaanyị nke abụọ bụ Judy Austin Muoghalu, bụ onye ọ gbara ama mụtara ya otu ọmarịcha nwa nwoke tinyere ọkụ na soshal midia abalị ole na ole gara aga. Ọtụtụ ndị mmadụ katọọ Yul bụ onye a ma dịka onye ụka Kraisti nakwa onye na-etokarị nwaanyị mbụ ya na soshal midia dịka onye nọnyere ya oge o nweghị ka ọ ha ya. Mana, Uche Edochie, bụ nwaanne ya nwoke tọrọ ya kwuru na ọ bụ iji dozie ihe mebiri emebi mere ka Yul mee nke a na-agbanyeghị na ezinaụlọ ya akwadoghị ya. N'ozi Uche Edochie wepụtara n'akara Instagram ya ụbọchị Fraide, o kwuru sị, ""Anyị gwara Yul ya emena ya,. Mana ọ gara n'ihu mee ya."". "" Ịgbalitula mbọ ịmanye okenye ime ihe ọ chọghị ime n'ihe gbasara mekọrịta mmadụ na ibe ya ?"" ""Yul chere na ịlụ nwaanyị nke abụọ bụ ụzọ kacha mma imezi ndahie ọ dahiere. O were ya nnukwu obi isi ike ime ya."" Uche kwuru na nsogbu na-eri ya nri n'afọ bụ nke Nwaanyị nke bụ bụ ezigbo mmadụ, nke abụọ bụ na Yul bụ onye na-ekpe ụka Kraisti. O nweghị onye na-anụbu maka Uche Edochie n'ihi na ọ bụghị onye ọtụtụ okwu. Mana ihe na-afịọ na soshal midia kemgbe akụkọ na Yul tụwara nwaanyị ime n'ama, lụọ ya akpalite ya ikwu okwu n'ọha. Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka nwa amadị a: •Uche Edochie bụ nwanne Yul Edochie, onye ihe ejije Nollywood a ma ma. •Nna ha bụ Pete Edochie bụkwa onye a ma ama •Uche Edochie gara akwụkwọ na ụlọ ọzụzụ maka nka akpọrọ Insititute of Fine Arts nke dị na mahadum 'University of Nigeria' Ọ bụ onye ihe eserese sonyerela na ngosi esere emerela n'ebe dịka Amerịka, London na Paris." https://www.bbc.com/igbo/61254536 +entertainment Osinachi Autopsy Report: Ihe ndị uweojii kwuru maka mpụtara nyocha ime ahụ ozu Osinachi Nwachukwu "Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja bụ Josephine Adeh kwuru na mpụtara nyocha ime ahụ e mere ozu otiegwu Osinachi Nwachukwu a pụtala ugbua. Adeh onye zipụtara ozi a n'ụbọchị Tuzde kwuru: ""Site n'usoro kacha mma nakwa ukpuru nnyocha so ya maka etu otiegwu a ma ama bụ Osinachi siri nwụọ, anyị mere nnyocha ime ahụ n'ozu ya."" ""Mpụtara ya apụtala ugbua, anyị ezigarala ya onyeisi ndị na-ahụ maka ikpe ọha maka nnyocha nakwa ka o binye ya aka ma kwuo etu ikpe a ga-esi gaa n'ihu."" Cheta na otiegwu a nwụrụ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Eprel, ọtụtụ nke gụnyere ezinụlọ ya ekwuola na ọ bụ ntigbu ka etigburu ya dịka a na-atụ di ya bụ Peter Nwachukwu aka n'okwu a. Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ IGP Usman Alkali Baba kwuru n'ụbọchị itolu nke ọnwa Eprel na ha gakwụrụ ụlọọrụ National Hospital Abuja ka ha mee nyocha akpọrọ 'Post Mortem' na bekee iji chọpụta ihe kpatara ọnwụ Osinachi Nwachukwu bụ otiegwu ụka ama ama nwụrụ na nso nso a. O kwuru na ha ga-akpụpụ di Osinachi ụlọikpe maọbụrụ na-achọpụta na aka ya dị n'ọnwụ nwunye ya. Usman Baba kwuru nke a mgbe ọ na-anabata minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị bụ Dame Pauline Kedem Tallen na Naịjirịa taa bụ April 20, 2022 n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja. Ihe ndị ọzọ IGP na Tallen kpara maka ya gụnyere: Nwuchi ahụ na-abịa dịka akụkọ ọnwụ Osinachi e ji ""Ekwueme"" mara pụtachara n'April 8, 2022 nke mere ka ndị mmadụ bido kwuputewe etu di ya si akpagbu ya mgbe ọ dị ndụ. Ụkọchukwu ụlọụka Dunamis International Gospel Centre bụ dọkịta Paul Eneche ekwuola na ọ maghị na di Osinachukwu Nwachukwu na-emekpa ya ahụ. O kwuru nke a n'ozi o ziputere n'onyonyo o tinyere n'akara Facebook ya taa bụ Eprelu 13, 2022. Osinachi Nwachukwu e ji ""Ekwueme"" wee mara nwụrụ n'ụbọchị Eprelu 8, 2022, kamgbe ahụ ndị uweojii anwụchiela di ya bụ Petere Nwachukwu maka ebubo imekpa ya ahụ mgbe ọ dị ndụ. Dọkịta Enenche kwuru n'ime onyonyo o wepụtara taa na ọ bụ mgbe Osinachi Nwachukwu nwụchara ka ọ malitere nụwa na di ya na-emekpa ya ahụ nke ukwuu. O kwuru na o juru ya anya na ọtụtụ mmadụ ma mana ya amaghị maka ya. N'ọnụ ya, ""Osinachi bụ nnukwu uru baara ụka Christ nakwa agbụrụ a"" O kwuru na Osinachi na di ya gwara ya na ọ na-arịa ọrịa obi n'ọnwa abụọ gara nke mere ka o nyere ha aka nweta ụlọọgwụ ebe ọ ga-anata ọgwụgwọ zuruoke. Ọ ruola ụbọchị ise kamgbe a nụrụ akụkọ maka ọnwụ Osinachi Nwachukwu bụ ọgụ egwu e ji ""Ekwueme "" wee mara mgbe ọ dị ndụ. Ọtụtụ mmadụ tụmadị ezinaụlọ Osinachi tinyere ọnụ gbasara akụkọ etu nwaanyị a si nwụọ. Nke a mere ndị uweojii Naịjirịa ji gaa nwụchie di Osinachi bụ Peter Nwachukwu maka ebubo imekpa Osinachi ahụ. Mana ugbua, ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ ""ihe mere na a nụbeghị pim n'ọnụ ụkọchukwu Dunamis International Gospel Centre bụ dọkịta Paul Enenche bụ ebe Osinachi na di ya na-ekpe tupu ọ nwụọ. Ụfọdụ na-ekwu na ebe Osinachi bụ otu n'ime ndị ukwu na-agụrụ egwu n'ụlọụka Enenche, na o kwesiri ịpụta kwuo okwu gbasara ọnwụ nwada a. Cheta na otu n'ime ụmụ Enenche a kpọrọ Deborah Enenche depụtara nwute ya maka ọnwụ Osinachi. Nke a mere ndị mmadụ ji ajụ ma a ga-ewere okwu Deborah dịka ihe ụlọụka Dunamis nwere ikwu gbasara ọnwụ Nwachukwu. BBC Igbo akpọọla akara ekwentị nọ n'ọbaozi websaịtị ụlọụka Dunamis ọtụtụ mgbe mana o nweghi onye zara. Osinachi Nwachukwu na Pastor Paul Enenche gụrụ egwu akpọrọ ""Nara Ekele"" n'afọ 2018. Ihe o dere n'akara Instagram ya. Gọọmentị Naịjirịa aṅụọla iyi inwete ikpe ziri ezi maka ọnwụ Osinachi Nwachukwu bụ oti egwu ụka a ma ama. Minista na-ahụ maka ụmụnwaanyị na Naịjirịa bụ Dame Pauline Tallen ṅụrụ iyi a n'akwụkwọ ozi o wepụtara na Mọnde. Ọ sị na akụkọ ọnwụ Osinachi kaara ịgafe etu ahụ ma ọ bụghị na kepu kepu banyere mmekpahụ site n'aka di ya bịara pụtara ihe. Tallen sị na okwu mmekpa ahụ n'ime ezinaụlọ bụ ọrịa ọjọọ e kwesịrị iwepu na Naịjirịa n'ụzọ ọbụla. Ọ sị na ministri ya ga-agba mbọ hụụ na ọnọdụ a agaghị emetụta ụmụ Osinachi ugbua ma ha too. Nke a na ka a na-ebo di Osinachi bụ Peter Nwachukwu, nọ n'aka ndị uweojii ugbua ebubo na aka ya dị n'ọnwụ ya. Ndị uweojii anwụchiela Peter Nwachukwu, di Osinachi Nwachukwu bụ oti egwu ụka ọnwụ ya kpọtụrụ na ngwụcha izuụka make ebubo na aka ya dị n'ọnwụ nwuye ya. A nwuchiri Nwachukwu n'ụbọchị ụka dịka nwanne Osinachi nke nwoke wegara ndị uweojii mkpesa. Osinachukwu, onye e jiri egwu ya ' A kpọrọ ""Ekwueme"" nwụrụ n'ụbọchị Fraide n'ụlọọgwụ a kpọghị aha ka ọ gbachara afọ iri anọ na abụọ (42yrs). Akụkọ fegharịrị kwuburu na Osinachu nwụrụ site n' ọrịa kansa akpịrị mana nwanne Osinachi nwaanyị bụ Favour Made gwara ụlọorụntaakụkọ Vanguard na ọ bụ ọbara kpụkọrọ n'obi Osinachi site n'ihe di ya kụrụ ya n'obi mere o jiri nwụọ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweoji Abuja bụ Josephine Adeh gwara BBC na ndị ọrụ ha nwuchiri Peter Nwachukwu n'ezie ma sị na nnyocha na-aga n'ihu. Kemgbe ọ nwụrụ, ọtụtụ maara ya gunyere FranK Edward pụtara na soshal midia were na-akọ etu di ya si akụ ya ihe ma na-emekpa ya nnukwu ahụ n'ụzọ di iche iche. Kemgbe ọ nwụrụ, ọtụtụ ụmụ Naijiria atụọla arị®ị ọnwụ ya. Nkechi Blessing, onye ihe ejije Yoroba a ma ma kwụrụ n'ihe onynyo o wepụtara „Ọ ka mma na ị dị ndụ karrịa ịnwụ n'ihi na-gaba ọsọ ihe ndị mmadụ ga-ekwu ma ị hapịgba al.ụkwaghịm."" Pastọ Funke Adejumo,bụ ụkọchukwu nwaanyị a ma ama. „ Kwuru na ọ bụ®ụ na ya matara ihe nwa ada ahụ na-agabi ga na ya kara inye ya ohere ị gbata ọsọ ndụ n'ụlọ ya ruo ọnwa isi ma kwenkwa na ọ ha ahụ isi ya ka nwoke ahụ bụ dị ya taa ahụ dịka ọ dị n'iwu."" Pastọ Sarah Omakwu , onye kwuru na egwu na-akpali akwa n'ọtụtụ ndị mmadụ tụrụ arịrị na e ji ajọ obi na-apụ alaeze Kraisti onynye olu nwaada ahụ. "" Osinachi Nwachukwu anwụghị anwụ, ogbugbu ka e gburu ya"" Ọ dụrụ ụmụnwoke ọdụ ka ha bụrụ gọọmentị ezinaụlọ ha. ""Ọ bụrụ na ịchịghị ọfụma, ihe ị na-ekwu bụ na ọ bụ etu Chukwu si achị.: Dịka ụmụafọ Naịjirịa nakwa ndị ụwa na-ebe akwa maka ọnwụ oti egwu a ma ama bụ Osinachi Nwachukwu, ọ ga-adị mma ka anyị leba anya n'ụfọdụ ihe gbasara ya. Na mkparịtaụka nwada a na otu ụlọọrụ mgbasaozi bụ Grevmovement nwere n'ọnwa Ọktoba afọ 2021, ọ kọwara etu egwu ya na-aba n'ụmị si zọpụta otu nwoke n'aka ndị ntọrị. Nwachukwu sị na ọ bụ egwu ya nke ọ kpọrọ 'Ikem' bụ nke mmụọ Chineke tinyere n'ime mgbe ọ gara n'ukwu ekpere. Ọ sị na ọ bịara tipụta egwu ahụ na o bidoro wuwe nke ọma nke mere otu nwoke ji were ya mere ụda ekwentị ya (ringtone). N'okwu ya ""otu nwoke kpọrọ m n'ekwentị sị m na egwu ahụ bụ 'Ikem' zọpụtara ya n'aka ndị ntọrị na Portharcourt"". ""mgbe ndị ntọrị jidere ya, ekwentị ya kụrụ ya bụrụ egwu ahụ na-agụ, ndị ntọrị ahụ jụrụ ya onye nwe olu a? Ọ sị ha na ọ bụ nne ya ukwu n'ime Chineke, ha wee nyaghachị ya ekwentị ya ma sị ya si n'ụgbọala ha rituo"". Nwachukwu gakwara n'ihu kọwaa etu egwu ya si gwọọ onye na-arịa ọrịa ngwa ngwa ọ na-agụ egwu n'otu ọgbakọ ọ gara. Nwachukwu sị na ọ malitere iti egwu mgbe ọ dị n'obere, n'ụlọụka Christ Apostolic, mecha sonye n'otu egwu a kpọrọ 'Glorious singers'. Ọ sị na mgbe ọ lụrụ di ya bụ Peter Nwachukwu, ha kwagara Abuja bụ ebe ha malitere ife ofufe n'ụlọụka Dunamis bụ ebe akaraka ya nọ chakee. Aha nwada Osinachi Nwachukwu onye gụrụ 'Ekwueme' na-akpọtụ ebe nIile na soshal midia kemgbe ụbọchị Satọde 9 Eprel, 2022 mgbe akụkọ pụtara na ọ nwụọla. Hyacinth Ogbu bụ onye nchịkọta egwu otu 'Glorious singers' bụ ebe Osinachi na ejima ya bụ Amarachi Eze malitere iti egwu gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu. Ogbu sị na ọ bụ ihe mwute nye ndị otu ha nakwa ezinaụlọ Nwachukwu maka akụkọ banyere ọnwụ ya. Nwachukwu, onye gụrụ egwu ọtụtụ ndị ụka kraịst ma bụ ""Ekwueme"" bụ onye egwu ya na-amasị ma na-akpalite mmụọ ndị mmadụ n'ụzọ dị iche iche. Ndị mmadụ na-agba akaebe etu egwu ya si eme ka ha na-echee echiche maka ndụ ha na mmekọrịta ha na Chukwu kere ha. Ndị maara Nwachukwu kọwara ya ka dịka ezigbo mmadụ nakwa onye ihe gbasara Chineke na-anọ ọkụ n'obi. Ihe ndị ọzọ i kwesịrị ịma maaka Osinachi Nwachukwu" https://www.bbc.com/igbo/afirika-61050237 +politics Ebe ndị Ugwu na-akwado Pantami, Gumi na Miyetti Allah, ana m akwado Nnamdi Kanu - Bishop Onuagha, Methodist Church, Onitsha Diocese "Bishọp ụka Methodist na Naijirịa nke mpaghara Ọnịcha Dayọsis bụ Biereonwu Livinus Onuagha ekwuola na Nnamdi Kanu onyeisi otu Ipob Gọọmentị Etiti anwụchịri na-anọchite anya ihe karịrị ndị Igbo pasenti iri itoolu na itoolu (99%) ya. Onuagha kwuru na ọtụtụ ndị Igbo kwenyere na okwu Biafra Nnamdi Kanu na-ekwu na-agbanyeghị agwa dịwara aghaa ọ na-akpa dịka onye ntoroọbịa. N'akwụkwọ ozi Onuagha binyere aka ma depụta n'ụbọchị Tuzde n'Ọnịcha , Anambara steeti, o kwuru na ndị Igbo na-akatọ Nnamdi Kanu kemgbe a nwụchuru ya anụjughị ara nne ha afọ, nke ha na-aghọta oge a nọ na ya. N'ihi na dịka o siri kwu, "" ịga dị n'aka Nnamdi Kanu dị n'aka onye Igbo ọbụla."" Onuagha o nye sitere n' Abuoma 137:1-4) were nye ntuziaka sịrị, "" Onye ọbụla na-akatọ Nnamdi Kanu ugbua anwụchịrị ya bụ efulefu na onye na-amaghị ihe."" ""Ekwuola m ihe m kwuru ma enweghị onye m ga-arịọ mgbahara maka ihe a m kwuru"". Onuagha kwuru sị,"" Naijirịa bụ mba agbụrụ na okpukperechi juputara, ọnye ọbụla gbahapụrụ onye nke ya, amaghị ihe ọ na-eme."" O kwuru na ya ga-akwụsị Nnamdi Kanu n'azụ ike , ebe ọ bụ na ndị Ugwu kwụ Sheik Gumi, Patami na ndị Myiyetti n'azụ ike. ""Ebe ọ bụ na ndị Ugwu ka kwadoro Pantami, Gumi, Miyetti Allah,dgz agaghị m agbahapụ Nnamdi Kanu."" Bishop Onuagha kwụrụ na "" N'ezie Kanu nwere ebe o si eri mperi, mana e wezụga ndajọ ndị ahụ, ọ bụ ihe ọma nyere ọ bụghị naanị Ndigbo, Ndị Ndịda Anyanwụ Naijiria."" ""Obi ọ kara bụ ihe mere ka bido kwanyerewere ya ugwu."" O kwuru na ajụjụ onye ọbụla kwesịrị ị na-ajụ bụ ""na mmegbu na mkpagbu Kanu na-ebu agha ya ọ bụ eziokwu na a ọ bụghị."" ""Ị gaghị ama uru onye ara nọ n'ezinaụlọ gị baaraa gị rue oge igwe ndị ara wakporo be nna gị."" O kwuru na ""Naijiria anaghị aga n'ihu, ọ gaghị agakwanụ n'ihu ma ọ bụụ na emeghị ihe e kwesịrị ime maka ọnọdụ emeghị onye ka emere ibe ya."" ""Ihe na-eme na Naijiria bụ oke mmegbu, ịchakpo mmadụ anya,ịkpụchapụ n'akụkụ na ime ụfọdụ ndị ohu."" ""Ndị na-erite uru na ọnọdụ mkpagbu ndị a agaghị achọ ka edoziegharịa etu ihe si aga.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-57743564 +politics Ihe m gatara ka m gara ịhụ Nnamdi Kanu ụbọchị Eprelụ 28,2022 - Ọkaiwu Ifeanyị Ejiofor "Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejofor etiela mkpu na na-agbanyeghị ntuziaka ọkaikpe na-ekpe ikpe Kanu bụ Binta Nyako nyere ka e nye ya ohere ịgbanwe akwa ya, na ndị uweojii DSS ekweghị nke a. Ejiofor bokwara ebubo na a na-akwụ Nnamdi Kanu agụụ site inye ya nri naanị otu ugboro n'ụbọchị. Ebubo ndịa niile dị na ozi o wepụtara ụbọchị Tọzde, abalị 28 nke ọnwa Eprelụ dịka ọ gara zute Kanu n'ogige ndị uweojii pụrụiche bụ Department of State Services (DSS) nke o depụtara ka njem a si gaa n'akara Facebook ya. Ejiofor sịriị: ""Ọ bụ ihe mwute na na-agbanyeghị ntuzIaka nke Ọkaikpe nyere ọkaiwu DSS ka enye onye ndu (Nnamdi Kanu) mgbanwe akwa, were rue taa m gara hụ ya, e nyebeghị onye ndu mgbanwe akwa."" Ọ gara n'ihu kwu, ""Ọzọ, ọ gwara anyị bụ na anaghị enyezikwa ya nri ugboro ugboro. Iri nri otu ugboro n'ụbọchị na-emetụta ọnọdụ ahụike ya nke daturula adatu."" O kwuru na na-agbanyeghị nke a, na Kanu na-ekele ndị na-eso ya ma kwuo na ọ na-ekpere ha ekpere. Cheta na a na-ekpe Nnamdi Kanu, onye ndu bụ otu nnwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) ikpe maka ebubo metụtara ịkpa nkata ịkwatu Gọọmenti Naịjirịa nakwa iyi ndu egwu. Nke a na-abịa dịka Gọọmenti Etiti Naịjirịa si Kenya kpụlata ya n'ọnwa Juun afọ 2021. Onye bụdị Nnamdi Kanu na-ewu? Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ nwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob), o hiwere n'afọ 2012. A makwa na ọ bụ onye ndị mmadụ na-akpụkarị n'ọnụ n'ihi etu o si ama ndị nọ n'ọchịchị aka dịka ọ na-achọ nnwereonwe n'aka Naịjirịa. Ndị Department of State Services (DSS) nwuchiri ya mbụ n'Ọktoba 19, 2015. Ọ gara ụlọikpe na Nọvemba 18, 2015. Na Septemba 2017, ọ gbafuru n'ụlọ ya dị n'Afara Ukwu, Umuahia, mgbe ndị agha wakporo be ya, dịka akụkọ siri kwuo. Kamgbe ahụ o nweghi onye ma ebe ọ nọ, ma nwunye ya bụ Uchechị anyị jụrụ ajụjụ n'afọ 2018 sị na ọ maghị ebe Kanu nọ. N'afọ 2018, ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu. N'ọnwa Juun 27 afọ 2021, a nwuchiri Kanu na mba Kenya ma kpọlata ya na Naịjirịa mana mana onyeisi ụlọrụ nnọchiteanya Kenya na Naịjirịa kwuru na aka ha adịghị na nwuchi ya. Gọọmentị Naịjirịa kpọpụrụ Kanu n'ụlọikpe maka ọtụtụ ebubo gụnyere ibuagha megide gọọmentị nọ n'ọchịchị. Kanu site n'ọnụ ndị ọkaiwu ya agọọla ọtụtụ oge na aka ya dị ọcha n'ebubo ndị ahụ. A na-atụ anya na ọkaikpe Binta Nyako ji ikpe ahụ ga-ekpebi okwu n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Eprelụ, 2022 n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61254535 +entertainment Ada Jesus dead: Harrison Gwamnishu akọwaala etu Ada Jesus si nwụọ "Harrison Gwamnishu bụ onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onwe ya agbaala ama na e burula ozu ọkpaochị Mmesoma Obi gawa Ala Igbo maka akwamozu na olili ya. Ada Jesus nwụrụ n'ụzọ ụtụtụ ụbọchị Wenezde, n'ụlọọgwụ Zenith Medical Centre, dị n'Abuja . Dịka Gwamnishu siri gwa BBC Igbo na mkparịtaụka anyị na ya nwere n'ụtụtụ Tọzde, ndị dokịta chọpụtara ọrịa gụnyere ọrịa akịrị, kansa nke ara nakwa mkpọnwụ ahụ n'ahụ ya ka ha nyochara ya. O kwuru na ndị dọkịta nyere ya nleta mere ka ọnọdụ ya dịtụ mma tupu ọnọdụ ya akawanye njọ n'abali Tuzde mgbe a dụchara ntụtụ, ""ọ kwụsịrị ikwu okwu tupu dọkịta agwa anyị na ọ nwụọla"". Gwamnishu sị, ""ọ bụrụ na anyị matara n'oge maka ọnọdụ ahụike ya, ikekwe ọ gaghị anwụ."" ""Mana otu ihe mere bụ na ndị mmadụ gosiri ya ịhụnanya n'oge ikpeazụ ya."" ""O nwere ọgwụ a gbara ya, di ya kwuru na ọ bụ ka a gbachara ya otu ọgwụ ka ahụ bịara na-agbakasị ya, na-enye ya nsogbu."" O kwukwara sị na ọ bụghị 'ihe e zigara eziga' dịka ihe mmụọ tinyere Ada na nsogbu ahụ, na ọ bụ na ekwuputaghị maka ọrịa a n'oge. O kwukwara na ọtụtụ ndị mmadụ nọ na-akpọ ya na-ekwu na ha chọrọ iji obiọma ha nye Ada Jesus akịrị nke ha, iji hụ na ọ gbakere ma nwere onwe ya. Gere mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'uju ebe a: Lee ihe Gwamnishu kwuru na Facebook ya: Omee ihe ejije a ma ama bụ Rita Edochie ekwuola na ya bụ ""mkpụrụ agaghị egbuli egbu"". Nke a bụ nkwupụta mbụ ya ka ọ gachara otu abalị ọkpaọchi Mmesoma Mercy Obi bụ onye a ma dịka 'Ada Jesus' jiri nwụọ. N'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya, ọ sịrị na Chukwu mere ya nwaanyị siri ike nke ya ga-abụgide. ""Chukwu ji ike niile mere m nwaanyị siri ike, aga m adịrirị etu ahụ."" ""Mkpụrụ a gaghị egbuli egbu."" Tupu Ada Jesus anwụọ, ya na Rita Edochie nwere nghọtahie nke mere ka Edochie kwuo na ọ gaghị agbaghara ya, mana n'izu ole na ole gara aga tupu Ada Jesus anwụọ, Edochie kwuru na ọ gbagharala ya. Mana dịka Edochie mere nkwupụta ahụ taa bụ Tọzde, ọtụtụ na-eso ya na-akatọ ya maka enweghị obi mgbaghara, ebe ụfọdụ kpọrọ oku ka a kwụsị ikiri ihe ejije o so na ya. Rita Edochie, Odumeje na ihe ndị ọzọ a kpụ n'ọnụ maka ọnwụ Ada Jesus Naijiria dị ndị ezinaụlọ ya na ndị ihe ya amasi ka Ghana dịka akụkọ ọnwụ ya pụtara ihe taa bụ Wenezde. Mercy Mmesoma Obi a ma dịka ""Ada Jesus' nwụrụ n'ụlọọgwụ dị n'Abuja e bugara ya maka ịgwọ ya ọrịa metụtara akịrị. Dịka akụkọ siri kwuo, ọnọdụ ya kawanyere njọ n'abali Tuzde foro Wenezde, ebe ọ nwụrụ n'ụtụtụ taa ka o mechara abalị ole na ole o jiri mechaa ncheta afọ 23 a mụrụ ya. Ọtụtụ ndị mmadụ ma Ada Jesus dịka ọkpachị ma lee ihe ndị ụfọdụ ị maghị maka ya: Ọnwụ ya bụkwa ihe butere mwute nakwa arịrị n'uche ọtụtụ ndị mmadụ n'ihi na ọrịa ọ rịa ọtụtụ oge tupu ọ nwụọ. Lee ihe ha na-ekwu na soshal midia maka ọnwụ ya: Ọtụtụ ndị ihe Ada Jesus na-amasị na-akatọ onye na-eme ihe ejije a ma ama bụ Rita Edochie nakwa ụkọchukwu Chukwunaeme Ohanaeme a ma dịka 'Odumeje' maka okwu ha kwuru makaAda Jesus dịka ọ nọ n'akwa ọrịa. Edochie na Odumeje kwuburu na ha agaghị agbaghara Ada Jesus maka okwu ndị o kwugide ha nke ha kwuru bụ okwu asị. Adaeze siri na Edochie kwuru na isi Ada Jesus agaghị eji isi ya pụta n'ọrịa ya, na ugbua a na okwu ahụ emezuola. Chumalo kwuru na ọ bụrụ ezie na Ada Jesus anwụọla, na Rita Edochie kwesịị ịza ajụjụ maka ya. Bigjohn na-ekwu na Odumeje na Rita Edochie anaghị agbaghara mmadụ, kedụ ka ha sị arịọ chukwu mgbaghara. Everest na-ekwu na ọ nwụghị maka na ọ kparịrị Odumeje na Rita Edochie, na ọ bụ ọnwụ buru ya. Captain Aluko na-ekwu ka Chineke gbaghara ndị niile jụrụ ịgbaghara ya. Oge BBC gbalịrị ịnụta olu Rita Edochie maka ihe na-akpọtụ, ọ zaara ekwentị ya ma gwa anyị na ya nọ na nzukọ na ya enweghị ike ikwu ihe ọb��la ugbua. Mana ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ọbụghị ọgụ mmụọ gburu Ada Jesus, na ọbụ ọrịa akịrị nakwa enweghị ezi nleta n'oge. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" https://www.bbc.com/igbo/afirika-56817092 +politics CBN Governor: Godwin Emefiele ritue n'ọkwa tupu ị chọwa ọkwa onyeisiala - Ezekwesili "Oby Ezekwesili, onye bụbu Mịnịsta agụmakwụkwọ na Naịjirịa, asaala Godwin Emefiele maka agụgọ na ọ bụghị ya zụrụ akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala. Cheta na akụkọ pụtara na Godwin Emefiele bụ onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa a kpọrọ 'Central Bank' na bekee, azụrụla akwụkwọ iji zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na pati 'All Progressives Congress'. Ezekwesili gwara Emefiele na ""ọ bụ ọchịchọ ziri ezi ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 mana ị ga-ebu ụzọ rituo n'ọkwa dịka onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa."" O depụtara n'akara Twitter ya sị ""egwuregwu iji ndụ ndị Naịjirịa na ọkwa gị egwu nwere nsogbu. Ritue n'ọkwa"" Nke a na-abịa dịka Emefiele gọrọ n'onweghi onye ọ sị ya zụtara ya akwụkwọ mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala. Ọ sị na ọ ga-eji ego ya zụta ya maọbụrụ na ọ batara ya n'uche ịzọ ya bụ ọkwa. Onyeisi ụlọakaụ etiti bụ Godwin Emefiela apụtala kwuo na onweghi mgbe o ji zie onye ọbụla gbatara ya akwụkwọ ịzọ onyeisiala. O kwuputara nke a n'akara Twitter dịka ọ na-ewu ebe niile na otu ndị ọrụ ugbo jịkọrọ aka zụtara akwụkwọ iji zọ onyeisiala. Emefiele sị ""Ọ bụrụ na m chọọ ịzọ ọkwa ọbụla, m ga-eji ego m rụtara n'ọrụ dịka onye ọrụ ụlọọakụ kemgbe afọ iri atọ na ise"" Ọ si na ọ ga-eme nke ya n'uzo ziri ezi debere iwu kpuchiri ala Naịjirịa. Godwin Emefiele bụ onyeisi ụlọakụ etiti esonyela ndị na-azọ ọkwa ọkwa Onyeisiala Naịjịrịa nke afọ 2023. Nwamadị a dị afọ iri isii chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n'aha pati All Progressive Congress (APC). Otu onye ọrụ na pati APC gwara BBC na Emefiele azụọla akwụkwọ mmasị isonye na ntuliaka ime ụlọ nke pati ahụ. Ọ bụ ihe a hụtụbeghi na mbụ na onye ji ọkwa onyeisi ụlọakụ etiti ka nọ n'ọrụ ga-apụta ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa. O nweghi ebe iwu ụlọakụ etiti kwuru na onye bụ onyeisi ha maọbụ osote ya agaghị azọ ọkwa onyeisiala mama iwu gbochiri ịbụ onye omeiwu gọọmentị etiti maọbụ nke steetị ọbụla. N'otu akụ iwu ntuliaka egbochibeghi onye ọbụla ji ọkwa na gọomentị ịpụta zọọ ọkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Nke a so n'iwu e na-ebe anya na mmegharị iwu ntuliaka bụ gọọmentị na ndịome iwu ka na-arụrịta ụka banyere ya. Emefiela abụghị onye mbụ ji ọkwa na gọọmentị ga-apụta ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa, ndị ọzọ merela nke a gụnyere; Chibuike Amaechi bụ minista na-ahụ maka ime njem, Chris Ngige bụ minista na-ahụ maka ndị ọrụ bekee, Ogbonnaya Onu bụ minista na-ahụ maka sayensị na tekịnụzụ na ndị ọzọ. Ihe i kwesịrị ịma maka Godwin Emefiele" https://www.bbc.com/igbo/afirika-61358116 +sports Nigeria Vs Guinea: Ugo amaburula enyi Guinea tụọ n'ala Dịka Naijiria na Guinea na-ezute onwe ha ugbua, ọ bụrụ na Naijirịa merie, ha etozuo ịbanye agba nke 16 n'asompị Afcon. Asọmpi a bụ ọgụ na mgba dị n'etiti dike abụọ, enweghi onye nyere ibe ya goolu n'ime ọkara mbụ ha gbara. Mana Naịjirịa ji bọọlụ n'ụkwụ karịa ndị Guinea dịka otu abụọ gbara shọọtụ anọ nakwa atọ chere la ihu na neetị. N'ime nkeji iri 27, 62 na 66 Simon Falette, Ahmed Musa na Ernest Seka nwetere akwụkwọ odo odo nke eji dọọ ha aka na ntị. N'ime nkeji 73, Kenneth Omeruo ji isi sụba gọọlu n'opio ndị Guinea site na bọọlụ elu Moses Simon gbaara ya. https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48774555 +politics Nnamdi Kanu News: Ihe Nnamdi Kanu gwara m taa - Ọkaiwu Aloy Ejimakor Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu, onyendu ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwuola ihe ọ gwara ya mgbe ha gara zute ya n'ụlọmkpọrọ. Ọkaiwu Ejimakor kwuru na ya na Kanu na ndị ọkaiwu ya ndị ọzọ gụnyere Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor na Ọkaiwu Maxwell Opara zutere, ebe ha kpara maka ikpe ya a ga-ekpe n'ụbọchị Wenezde, Nọvemba 10. O kwuru na Kanu ji n'aka na a ga-ewepụ ya n'ụta mgbe a ga-ekpecha ya bụ ikpe. N'otu aka ahụ, Ejimakor kwuru na Nnamdi Kanu ji ohere nzukọ ha na-ekele ndị otu ya na ndị nkwado ya. Cheta na ụlọikpe yigharịrị ikpe Kanu ruo Nọvemba 10 ka e kpechara ya n'ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba. Marakwa na gọọmentị Naịjiria nwụchiri Nnamdi Kanu kemgbe 27 nke ọnwa Juun afọ 2021, ma bo ya ebubo metụtara iyi ndị egwu nakwa ihe ndị ọzọ so ya. https://www.bbc.com/igbo/afirika-59211474 +health Herpes: Mata maka ọrịa nwerike ibute kansa akpa nwa. "Akụkọ na-ekwu na otu nwoke akpọgala otu nwaanyị ụlọikpe maka na ọ gwaghị ya na ọ nwere ọrịa Herpes tupu ha esusuo ọnụ. Nwoka a gbara agwụrụ na nwaanyị a ga-akwụ ya $236,000 maka ihe niile ọ gabigara kemgbe ọ sị na nwaanyị a bunyere ya bụ ọrịa. Nwoke na-ekwu na otu ihe ga-akacha eri ya ego bụ ọgwụgwọ ya nke ọ sị ga-eri ya $181,700. Nke a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ jị ajụ sị , ""Gịnị bụ ọrịa herpes a?"". Anyị kpọtụrụ dọkịta Prince Akahara ka ọ gbaa anyị ọgba n'eze maka ọrịa coronavirus. Herpes bụ ọrịa a na-ebute site na mmekọ ahụ nke gụnyere nsusu ọnụ na mmekọ nwoke na nwaanyị. Herpes dị ọtụtụ nke gunyere ""Herpes Simplex virus type 1 (HSV-1) na ""Herpes Simplex virus type 2 (HSV-2). Anaghị agwọ ọrịa herpes agwọ nke mere na ọtụtụ ndi mmadụ ji atụ ya egwu. I jị maa atụ , HSV-1 na-emekarị n'ọnụ ebe HSV-2 na-eme n'ike, ọtụ maọbụ amụ. Kama onye bụ HSV-1 metụ amụ maọbụ ike na ọtụ mmadụ, onye ahụ ga-ebute HSV-1 n'ene ndị ahụ. Nke ọzo bụkwa na mmadụ were ọnụ ya metụ onye bu HSV-2, HSV-2 ga-eme ya n'ọnụ. Ndị ngalaba WHO ekwuola na mmadụ ijeri atọ na ụma na erubeghị afọ iri ise bụ HSV-1 na mba ụwa niile ebe mmadụ nde narị anọ na iri itolu na otu dị ihe dịka afọ iri na ise ruo afọ iri anọ na itolu bu HSV-2. WHO kwukwara na onye nwere HSV-2 kacha nwee ike ibute ọrịa obirinajaọcha (HIV). Ha kwukwara na onye nwere ọnye sitere na HSV-1 agaghị enweta ya bụ ọrịa na akụkọ ike ya. Na-agbanyeghị na ọ naghị emekarị, kama nne nwereike ibunye nwa ya ọrịa herpes mgbe ọ na-amụ ya. Herpes nwereike ị nọ n'ahụ mmadụ ọtụtụ afo ma onye ahụ agaghị amata. Kedụ etu ị ga-esi ebute ọrịa Herpes? Herpes kacha efe mmadụ site na mmeko ahụ di iche iche. Kama onye bụ ọrịa herpes metụ ọnya, ọkọ ahụ maọbụ ebe ọkụ gbara ahụ mmadụ, onye ahụ nwereike ibute ọrịa Herpes. Ụzọ ọzọ bụkwa na onye metu ọnye herpes aka ma were aka ahụ metụ onwe ya n'ọnụ, ike n'akụkụ dị ya nsọ maọbụ anya, onye ahụ nwereike ibute ọrịa herpes. Eziokwu bụ na ọbụghị iwu na mmadụ ga-edina mmadụ tupu o bute ọrịa herpes. Ụfọdụ ndị na-ebute ya bụ ọrịa site mgbe okenye dịka nne maọbụ nna nwere Herpes nke ọnụ susuru her ọnụ, her nwereike ibute ọrịe herpes nke ọnụ. Ọ bụghị kwa iwu na mmadụ ga-ahụ ọnya tupu ị mara na ị bu ọrịa Herpes n'ihi na onwere ike izo n'ahụ mmadụ. Ihe Dokita Akagharasị mmadụ niile kwesiri ị mata maka ọrịa Herpes. Dọkịta aha ya bụ Prince Akahara kwuru na nje Herbes nwereike ị nọ n'ahụ gị ma o nweghị ihe ọ ga-eme gị. Ọ kọwara na ọ dị ebe niile n'ụwa. Akahara kwuru na nke kacha dị kwa ire bụ HPV-6, HPV-12 na HPV-8 nke nwereike ibute ọrịa kansa nke akpanwa kama enwere ọgwụ mgbochi maka nje ndị nke a. O kwuru sị "" Iyi okpunnabuenyi na-enyere aka igbochi mmadụ ibute nje a mgbe ha na mmadụ na-enwe mmekọ"". Kama ọ kwuru na ihe kachasị mkpa bụ ka ndị mmadụ hara inwe ọtụtụ ndị ha na-enwe mmekọ. Akahara kwuru sị ""ewepụ ndị a m kpọrọ aha, nje Herpes anaghị egbu mmadụ"". O kwukwara na dịka ọ bụ dọkịta, na ọ hụla ọtụtụ ndi mmadụ nwere ọnya na mpaghara ike ha maka ya bụ ọrịa ma ha amaghị na ha nwere ya. O kwuru sị ""N'ime mmadụ otu puku, otu onye nwereike i bu ya""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53047794 +health Coronavirus: Ọrịa juru aka dọtị nwereike ibufere mmadụ ọrịa. Dkt Adele McCormick sị Mahadum Westminster dị na Lọndọn na-egosi ụzọ kachamma iji gbochi mbute nje ndị dịka Covid-19. Dkt McCormick gosiri anyị etu e si akwọ aka ka anyị ghara ibute nje ma ọrịa. https://www.bbc.com/igbo/51688419 +politics Gọọmenti Etiti: Anyị anụbeghị akụkọ maka ọnwụ ụmụakwụkwọ Chibok Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Gọọmenti Etiti: Anyị anụbeghị akụkọ maka ọnwụ ụmụakwụkwọ Chibok Gọọmenti etiti agọnarịla akụkọ Ahmed Salkida wepụtara nke kwuru na ọ bụ naanị mmadụ iri na ise n'ime ụmụakwụkwọ Chibok otu narị na iri na abụọ eji eji ka dị ndụ Onye ndụmaọdụ onyeisiala na mgbasa ozi bụ Malam Garba Shehu kwupụtara nke sị na aka Ahmed Salkida adịghị na mkparịta ụka ịtohapụ ụmụaka ndịa. Nwaanyị zutere ọnwụya n'akwamozu ọ gara n'Enugwu Steeti Ihe mgbawa obi emela mgbe onye bịara ịkwa ozu soro ozu laa mụọ. Otu nwanyị akpọrọ Ngozi Eze zutere ọnwụya dịka otu nwoke otu nwoke bụ Daniel Chukwu jiri egbe gbagbuo ya n'amaghị ama. Nke a mere na Amanato mburumbu dị na Nkanu west nke Enugwu Steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Donald Trump adọọla Gọọmentị mba Sirịa aka na ntị Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump adọọla ndị gọọmenti Sirịa aka na ntị na ha ndị na njikere ịtụ ogbunigwe ọzọ ma ọ bụrụ na o sepụghi aka n'iji ngwaagha kemịkal awakpo ndị mmadụ. Ebe gọọmenti mba Sirịa ekwuola na aka ha adịghị na ngwaagha Kemịkal na ọ bụ ndị agha nnupiisi boro ha ebubo ime mwakpo ahụ. N'egwuregwu Ohere irite ọlaedo n'ịgba ọsọ ikeagwụnwamkpị n'egwuregwu Commonwealth akwala otu nwoke bụ Callum Hawkins nwafọ Scotland. Hawkins dara n'ala ugboro abụọ dịka ọ fọdụrụ nkeji abụọ ka o merie n'ọsọ ahụ nke mere onye ọzọ jiri rite ọlaedo ahụ. Nkeji nke mgbede a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Ihe nkiri nke taa N'ihe nkiri a, Sịnetọ Enyinnaya nke Abia Steeti kwuru na ndị ọchị ehi chọrọ ị napụ ụmụ afọ Naịjirịa ala ha n'ike https://www.bbc.com/igbo/afirika-43773971 +health 5G and Coronavirus: 5G ọ na-ebute coronavirus? Ọtụtụ na-ekwu na 5G na-ebute ọrịa coronavirus. Mana taata ka anyị nyobaa mara ma 5G ọ na-ebute coronavirus. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Chimezie Ucheagbo https://www.bbc.com/igbo/afirika-52165482 +health Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Ihe ọgwụ ike codeine na-eme ndị ntoroọbịa Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a Ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ na Nigeria bụ Emzor achụọla otu onye oreeahịa ha ma kwụsị mmadụ abụọ ọrụ n'ike n'ihi aka ha tinyere n'ire ọkwụ ụkwara,codeine, n'ụzọ megidere iwu. BBC malitela ụbọchị Tuusde ngosi ihe onyonyo ha mepụtara nke na-egosi mkpamkpa iṅụbiga ọgwụ ụkwara codeine oke na-eme na ndụ ndị ntoroọbịa. A malitere ihe ngosi a na Sheraton Hotel Ikeja, Legos, ụnyaahụ dịka ozi na-ekwu na achụọla onyeisi azụmahịa ụlọọrụ Emzor Pharmaceutical ndị aka na-arụ n'akụkọ ahụ. N'akụkọ ọzọ... Dika taa bụ ụbọchị ncheta ndịọrụ bekee n'ala Naịjiria, onyeisi ndị Nigeria Labour Congress NLC bụ Ayuba Wabba, ekwuola na ha agaghị ekwe ka kọmitii ahụ ehibere maka ileba anya n'ụgwọọrụ opekatampe ndị ọrụ bekee dọghachị aka elekere azụ n'imejupụta nkwa ahụ. Wabba kwuru nke a n'emume ha kpokobara ndị ọrụ na Abuja ụnyaahụ. Na mba ndị ọzọ: Ndị United Kingdom akwadola amụma nke ndị Iran n'agbanyeghị na US na Isreal hụrụ aka enwe na ya bụ ofe. Israel mere ihe ngosi iji kwuo na Iran ji ụzọ aghụghọ etinye aka n'ịrụputa ogbunigwe nuklea nke ndị Iran na-agọ. Gee nkeji nke mgbede a ebe a: Ihe onyonyo nke taa: https://www.bbc.com/igbo/afirika-43959663 +business Deregulation: Ọnụ ego 'fuel' dịzị n'aka ndị na-ere ya Ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa arịala ugbua, site na naịra 141 ruo naịra 151, mana ndị mmadụ na-ekwu na ha zụtara ya n'ọnụ naịra 160 n'ụtụtụ Tọzde. Nke a bụ maka atụmatụ ọhụrụ nke gọọmentị etiti wepụtara a na-akpọ 'deregulation'. Oge niile ka gọọmentị Naịjirịa na-ekwu maka 'deregulation', ọkachasị n'ihe gbasara mmepụta mmanụ ụgbọala nke Bekee kpọrọ 'Premium Motor Spirit' (PMS) maọbụ 'petrol'. 'Deregulation' pụtara na gọọmentị ga-esepụ aka ha kpam kpam n'ihe niile gbasara ego ole a na-ere mmanụ ụgbọala na Naịjirịa. Nke a pụtara na gọọmentị ga-ahapụrụ ndị nkịtị na-azụ ahịa mmanụ ụgbọala, nke a kpọrọ 'independent marketers' na Bekee, ka ha were aka ha na-ahazi ego ole ha ga na-ere ngwaahịa ha. Ọ pụtakwara na gọọmentị agaghịzi na-etinye ego iji butuo ọnụahịa mmanụ 'petrol', bụ nke a kpọrọ 'subsidy'. Ihe nke a na-egosi bụ na ọ bụrụ na ọnụahịa mmanụ agbidi (crude oil) rịa elu n'ahịa mba ụwa, ọnụ ahịa 'petrol' ga-agbali na Naịjirịa. Mana ọ bụrụ na ọ gbatuo, ọnụ ahịa 'petrol' ga-agbatu. Otu ihe kpatara nke a bụ maka na Naịjirịa anaghị emepụta petrol ga-ezuru ndị bi na ya. Ụlọọrụ atọ na-emepụta mmanụ ụgbọala na Naịjirịa enweghị nke na-arụ ọrụ etu o kwesịrị. Ya kpatara ụlọọrụ gọọmentị bụ 'Nigerian Natioonal Petroleum Corporation' na ndị nkịtị na-azụ ahịa mmanụ ụgbọala, na-azụ 'petrol' na mba ofesi, ma jiri ụgbọmmiri bubata ya na Naịjirịa. Nke a pụtakwara na ọ bụ ihe ahịa nyere na mba ofesi ga-ekwu ego ole ha ga-ere ya na Naịjirịa. N'oge mbụ, gọọmentị na-eji aka ha tinye ego ole a ga na-ere mmanụ ụgbọala, ma were ego akpa ya kwuzuo ndị na-ere ya ụgwọ nke fọrọnụ. Mana ugbua, ha esepụla aka na ya. Ọ bụ ya mere ọnụahịa mmanụ ụgbọala ji gbalie elu. Ndị ọkacha mara ekwuola na gọọmentị ekwesịghị itinye aka n'ego ole a na-ere mmanụ ụgbọala. Ha kwuru na nke ahụ ga-eme ka ndị mmadụ bịa tinye ego ha ma hazie ngalaba mmanụ agbidi ka ọ kawanye mma. Ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ ihe ihere na a naghị enwe ike imepụta 'petrol' na Naịjirịa, n'agbanyeghị na ��� bụ ebe a ka e si ebupu mmanụ agbidi. 'Deregulation' nwere ike inye aka ka ụdị ihe a kwụsị. Mana ugbua amalitere ya ọhụrụ, ọ ga-afụ ndị mmadụ ụfụ n'ahụ, n'ihi na ọtụtụ ndị dabeere na petrol iji kpata ihe ha na-eri. Kịtaa ọnụego ya rịrị, ọ gaghị atọ ndị mmadụ ọchị chaa chaa. https://www.bbc.com/igbo/afirika-54012081 +politics "Imo state: ""Ihedioha nwereike ịga mkpọrọ ma ọ kpachaghị anya"" - Mbaka" Ụkọchukwu na-elekọta Adọration Mịnịstrị n'Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ewerela olu ike baara gọvanọ Imo steeti pụrụ apụ bụ Emeka Ihedioha mba. Mbaka gwara Ihedioha ka ọ kpachara anya ya na 'ganị ganị' niile ọ na-akpọ kemgbe a chụpụrụ ya n'oche, ma ọ bụrụ na ọ chọghị iga ụlọ mkpọrọ. Ụkọchukwu ahụ kwuru na afọ juru ya nke ukwuu etu ụlọikpe kachasị si kpee ikpe Ihedioha na Hope Uzodinma bụ onye nọchiri ya dịka gọvanọ ugbua. Ọ gwakwara ndị mmadụ ka ha kwụsị ịgbagha maọbụ na-ekwu okwu ọjọọ maka amụma ya niile. Cheta na Emeka Ihedioha gwara BBC Igbo na mkaprịtaụka, na a gbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị https://www.bbc.com/igbo/afirika-51390842 +entertainment Igbo culture: Uru iri na abụọ ọmụ baara ndị Igbo "Igbo sị na a tụọrọ ọmarụ, ọmaru ma a tụọrọ ofeke, o tinye isi n'ọhia. Igbo bụ ndị Chukwu ji amamihe were gozie. Omenala Igbo dị omimi ma bụrụkwa ihe Igbo ji anya isi. Otu n'ime ihe e jiri mara ndị Igbo bu ""ỌMỤ"". Dịka ndị ihe Igbo na-amasị, BBC Igbo kpọrọ onye ọkachamara n'ihe gbasara omenala Igbo ma bụrụkwa onyeisi ndị otu Ekpe nke Ogbodiukwu dị n'Ụmụọkpara, Abịa steeti, bụ Ọkaiwu Nzenwa Ibe. Ọ gwara anyị ihe ndị bụ ""njirimara"" ọmụ nakwa ihe ndị Igbo ji ọmụ eme. 6. Ọmụ e kere n'ukwu osisi na-egosiputa na osisi ahụ dị nsọ n'omenala Igbo. 7. E kee ọmụ n'ụgbọala, ọ na-egosị na ụgbọala ahụ bu ozu. 8. Onye mmadụ bịara nye ọmụ n'aka, dịka ịsị onye ahụ na ya ""kpachara anya"" n'ebe onye ahụ nọ; ya bụ ịdọ aka na ntị. 9. Ndị otu Ọkọnkọ na-eji ọmụ ekewapụta onwe ha na ndị ọzọ na-abụghị ndị otu ha. 10. N'ebe dị ka Ibeku, Ụmụahịa, n'ala Igbo, igbubi ọmụ na-egosi na e mechaala mmemme ahụ dịka ekpe. 11. N'Ọhafịa, ndị na-agba egwu ikpirikpi ọgụ na-akpụrụ ọmụ n'ọnụ. Ha agaghị ewepụ ya tupu agbachaa egwu a. 12. N'agba ọhụrụ a, ndị ụka ji ọmụ eme ụkaọmụ bụ 'Palm Sunday' na Bekee. Ọ bụ ụbọchị ncheta etu Kraist siri banye Jerusalem dịka onye eze." https://www.bbc.com/igbo/afirika-48806285 +health Ụdịrị ọrịa kansa ara kachasị arịa ụmụnwaanyị isiojii na ụzọ e si egbochi ya Ndị nyocha sayensi mba Amerịka enyochapụtala njịkọ dị n’etiti ajọ ọrịa kansa nke ara na ụmụnwaanyị isi ojii. Nyocha ha gosiri na ọ bụ ụmụnwaanyị isi ojii ka ọrịa a kacha awakpo. Ha kwuru na ha na-atụ anya na ihe a ha nyochapụtara ga-akpali mmụọ ụmụnwaanyị isi ojii ka ha na-enyocha onwe ha ugboro ugboro gbasara ọrịa a. Laverne Faunteroy nwaanyị isiojii dị afọ 53 bi na New York kwuru sị, “Enweghị mgbe o jiri baa m n’obi maọbụ ịchekasị uche maka nke a”. Laveren na-ebi ndụ gbadoro ụkwụ n’ahụike. Kama otechaghị aka o mere emume ncheta ọmụmụ ya ka o nwetara ozi na o nwere ọrịa kansa. O kwuru sị, “ụjọ tụrụ m n’ihi ndị niile m ma nwere ọrịa kansa ejighị isi ha pụta, obi dara m mba, ezigbo ụjọ jidere m”. Laveren chọpụtara na o nwere kansa ara nke a kpọrọ ‘Triple Negative’ (TNBC). Ndị mmadụ anaghị enwekaarị kansa nke a, ọ na-eto ngwa ngwa, ọ na-agbasakwa ngwa ngwa, ma na-esi ike ịgwọta. Ọrịa kansa nke a na-egbu ọtụtụ ndị mmadụ. Dịka etu ọrịa kansa nke a siri dị, ọgwụ eji agwọ kansa ndị ọzọ anaghị adị ire n'ebe ọ nọ. Ọ bụ ụmunwaanyị na-erubeghị afọ iri anọ (40) ka ọ na-emekaarị ma bụrụkwa ụmụnwaanyị isi ojii ka ọ kachasị arịa. Nyocha ngalaba JAMA oncology bipụtara chọpụtara na ọrịa a ji pasentị 28% egbu ụmụnwaanyị isi ojii karịa ụmu nwaanyị ndị ọcha nwere ya bụ ọrịa. Ugbua, nyocha ọzọ akwadola ya bụ mpụtara na-ekwu na e nwere ihe jịkọro agbụrụ ụmụnwaanyị  Afrịka na ọrịa kansa 'Triple Negative' (TNBC). Dọkịnta Lisa Newman bụ Weil Cornell Medicine onye so na nyocha ndị sayensị nke mbaụwa maka ọrịa kansa ara n’ụfọdụ mpghara n’Afrịka kamgbe afọ iri abụọ. Nyocha ya gosiri na ọ bụ ụmụnwaanyị si na mpaghara Ndịda Afrịka dịka mba Gana ka ọria kansa TNBC kachasị enye nsogbu. O kwuru na ọ nwereike ịbụ maka na ahụ ụmụnwaanyị ndị a agbanweela maka etu ahụ ha si ebuso ọrịa Malarịa agha. Newman kwuru sị, “ nyocha ọrịa kansa ara nke 'Triple Negative' na-egosi na agbụrụ mmadụ si metụtara etu ahụ onye ahụ si alụsọ ọrịa a ọgụ nke na-emetụta ụfọdụ akụku ahụ mmadụ dịka ara nwaanyị”. O kwukwara sị, “ ọrụ nchọpụta a na-akpalị mmụọ anyị n’ihi na ọ na-aza ajụjụ maka etu ọrịa si awakpo mmadụ site n’agbụrụ”. Ọ gara n’ihu kọwaa, “Ọ na-enyekwa anyị ezi nghọta maka ọrịa a”. Newman gbara ama sị,” Anyị na-ahụta oke agbụrụ gbasara ọrịa kansa dịka ngalaba ahụike na ndị na-elekọta ndị ọrịa anya anaghị ekwe eji ụmụnwaanyị ndị agbụrụ Afrịka eme nyocha maka ọrịa kansa dịka ha na-eji ndị ọcha eme”. Laverne kwenyere na ọ dị mkpa na ụmụnwaanyị agbụrụ Afrịka soro na nyocha ahụike maka ọrịa. O kwuru sị, “ Echere m na akụkọ anyị na mba Amerịka na etu e siri kpasoo anyị agwa oge gboo, na-egbochi anyị isonye n’ihe ọbụla” O kwuru sị, “ Achọrọ m iso na ndị ga-eme ka ihe dịrị ndị mmadụ mma n’ọdịnihu”. Laverne enweghịzị ọrịa kansa dịka awara ya ahụ n’ọnwa Julaị maka ọrịa a. “Ihe niile na-aga nke ọma... eji m ya eme ọnụ na m soro na nyocha a. Ma jiri kwa ya na-eme ọnụ na m nyeere Dọkịnta Newman aka maka nyocha ya”. Na mba Briten, ụmụnwaanyị agbụrụ Afrịka ji ugboro abụọ karịa ụmụnwaanyị ndị ọcha gbasara ịnyochapụta ọrịa kansa oge ọ nọ na ngwụcha ya. Ngalaba NHS nke agbụrụ na Health Observatory na-akpọku ụmụnwaanyị isiojii ka ha soro na nyocha a”. Dọkịnta Georgette Oni bụ dọkịnta na-awa ụmụnwaanyị ahụ maka ọrịa Kansa bi na Notthingham kwuru na ọ bụ ezigbo nsogbu na ụmunwaanyị isiojii anaghị eso na nyocha ahụike ndị a. O kwuru sị, “Ihe m na-ekwukaarị maka ya ọtụtụ mgbe bụ ka ụmụnwaanyị ndị isiojii soro na nyocha ndị a, n’ihi na ọ bụ ebe a ka e si edepụta mpụtara nyocha ndị a”. “Ọ bụ etu a ka e si achọpụta etu e si alụso ọrịa a ọgụ, nke a bụ nke metụtara gị dịka mmadụ n’ihi na ọ bụ ụmunwaanyị agbụrụ Afrịka ka ọ kachasị metụta”. O kpebiri sị, “Ọ bụ mgbe ọtụtụ ndị mmadụ soro mee nyocha ka mpụtara ya na-aba oke uru”. https://www.bbc.com/igbo/articles/cevgqzgxkzpo +politics Ihe mere anyị agaghị akpọpụta Edozie Njoku dịka onyeisi APGA - Inec "Ngalaba nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) akọwaala ihe mere ha agaghị ahụta onyeisi otu alaka pati 'All Progressives Grand Alliance (Apga)' bụ Edozie Njoku dịka onyeisi pati ahụ n'ezie. Edozie Njoku site n'akwụkwọ ozi nke ndị ọkaiwu ya zigara onyeisioche Inec nke otu n'ime ha bụ C.L Egbuchunem binyere aka n'ụbọchị Tọzde bụ abalị iri atọ nke ọnwa June afọ 2022, na-arịọ ka ụlọọrụ Inec nabata mkpebi ụlọikpe kachasị (Supreme Court) nke kwuru na ọ bụ Edozie Njoku kwesịrị ịbụ onyeisioche Apga. N’ozi Victor Oye onye ya na Edozie Njoku na-adọ okwu onye ọchịchị APGA dịịrị, ọ gwara BBC Igbo na akwụkwọ ozi a Njoku zịpụtara n'ọha bụ akwụkwọ na-achịtaghị aja dịka o boro ebubo na Njoku bipụtara akwụkwọ ozi ụgha n’aha ụlọikpe kachasị iji ghọgbuo ndị mmadụ nakwa ndị ọrụ Inec. Ọ gara n’ihu kwuo na Njoku bụ onye agụghọ nke bụ na ọ bụghịdị onye pati Apga ma kọwa na ụlọikpe kachasị nyere ya bụ Oye ikike ịbụ onyeisi pati Apga n’ụbọchị 14 nke ọnwa Ọktoba, 2021. Mana ozi Njoku nye Inec si, ""Onye anyị na-anọchite detaburu ụlọọrụ gị akwụkwọ ozi n'abalị 29 nke ọnwa Juun afọ 2022 nke anyị gwa ụlọọrụ a maka mkpebi Ụlọikpe Kachasị na Edozie Njoku bụ onyeisioche Apga nke anyị kwakwụnyere n'akwụkwọ ozi a."" "" ...Anyị na-arịọ gị ka ịnabata onye anyị na-anọchite bụ Edozie Njoku dịka onyeisioche Njoku otu APGA ma nye ya ugwu dịrị ọkwa ya."" Mana nkọwa Festus Okoye bụ ọnụ na-ekwuru Inec nyere BBC Igbo na mkparịtaụka ekwentị na mgbede Fraịde, o kwuru na dịka o merela ihe karịrị ọnwa asatọ Ụlọikpe Kachasị nyere mkpebi ahụ (e nyere mkpebi ahụ na 14/10/2021), kwe nyere n'ezie na Inec emeghị ihe kwesịrị, na Edozie Njoku na ndị ọkaiwu nwere ohere ịgba Inec akwụkwọ maka nnupusi n'ihe ụlọikpe kpebiri. Otu APGA nwere alaka abụọ nke hiwere ntuliaka na Mee 31 afọ  2019 , otu tụpụtara Victor Oye dịka onyeisioche pati ahụ, na ntuliaka e mere n'Ọka, Anambara steeti, ebe alaka nke ọzọ mere ntuliaka n'Owere nke tụpụtara Edozie Njoku dịka onyeisioche ha. Oye gara ụlọikpe inweta ntuziaka ka Njoku kwụsị ikpo onwe ya onyeisioche Apga. Njoku gakwara n'Ụlọikpe Ukwu nke etiti nweta mkpebi sị ka Inec nabata ya dịka onyeisioche n'ezie. Oye gara n'ụlọikpe nke ya natakwa ikike ka e jichie mkpebi ahụ Ụlọikpe Ukwu nke Etiti nyere Njoku. Mana dịka Njoku na Oye na-adọrịta onye bụ onyeisi APGA, otu ndị isi pati ha chụturu ha abụọ n’ọkwa, họpụta Jude Okeke , onye bụ Osote Onyeisioche mpaghara Ndịda Anyanwụ mgbe ahụ ka o jigodị ọkwa na-arụ dịka onyeisioche n’ọnwa Juun afọ 2021. Oge ntuliaka gọvanọ Anambara kpụdebere nso, Jude Okeke bụbu osote onyeisioche pati ahụ n'oge gara aga, tipụtara ma chụtuo Oye na ndịisi Apga ma kwụsị Njoku ọrụ n'ike. Cheta na ọchịchị Okeke haziri ntuliaka imeụlọ nke nyere Chukwuma Umeoji ikike ka ọ nọchite anya Apga na ntuliaka gọvanọ Anambra e merela na Novemba 2021, ebe ọchịchị Oye mere ntuliaka wepụtara Charles Soludo dịka gọvanọ. Inec gburu oge itinye aha Soludo n'ọbaozi ha, Jude Okeke na ndị otu ya gbagara n'ụlọikpe Jigawa steeti nweta mkpebi kwuru na ọ bụ ya bụ onyeisioche APGA n'ezie dịka ọ nọchiri njoku bụ onye akwụsịrị n'ike. Inec gara n'ihu tinye aha Umeoji n'ọbaozi ha dịka onye ga-efere APGA ọkọlọtọ na ntuliaka gọvanọ Anambara steeti. Oye gbaghara ihe Inec mere na itinye aha Umeoji dịka  dịka onye ga-anọchite Apga ebe Okeke gbara akwụkwọ etinye aha ya dịka onye e soro gbaa akwụkwọ n’ikpe ụlọikpe Jigawa steeti kpere. Ọ gara ụlọikpe mkpegharị dị na Kano  rịọ ka ha tụsa mkpebi nke Jigawa n’ụsọ. Maka ịdahie n’usoro e si ekpe ikpe. Nke ụlọikpe ahụ nyere ya mkpebi. Ma nye Inec iwu ka e tinye aha Charles Soludo. Jude Okeke zọpụrụ gaa Ụlọikpe Kachasị sị ya dosa mkpebi Ụlọikpe Mkpegharị nyere n'ụsọ. N'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Ọktoba afọ 2021, Ụlọikpe Kachasị nyere mkpebi n'ikpe ahụ nwere akara No. SC.CV/687/2021 nke Okeke gbara Edozie Njoku , Alhaji Rabiu'u Garba (Garba bụ onye Jiwaga steeti gbaburu Njoku akwụkwọ na steeti ya sị na ọ bụ ya bụ onyeisioche Apga n'ezie) na Inec, Ụlọikpe Kachasị kụpụrụ mkpebi ụlọikpe Mkpegharị nke Kano sị na ""ihe butere okwu emeghị na Jigawa steeti"". Mana na ndepụta mkpebi ahụ, ụlọikpe dehiere aha onye ha nyere mmeri, denye Oye, hapụ idenye Edozie Njoku nke mere ka ha laghachi Ụlọikpe Kachasị ọzọ, ụlọikpe dezigharịa ya. Mana Oye gbaghara nke a sị na ọ bụ mpụ ịdegharị mkpebị ụlọikpe n'ụzọ na-akwụghị ọtọ. N'ihi nke a, Edozie Njoku chọrọ ka Inec kwuo na ọ bụ ya bụ onyeisi Apga, ọ bụghị Victor Ike Oye. Cheta na ọ bụ Victor Oye bụ onyeisi Apga ka ọ dị ugbua. Oge BBC Igbo kpọtụụrụ Edozie Njoku, o kwuru na n'ezie ọ bụ ya meriri ntuliaka nke Pati mere n'afọ 2019 iji họpụta onyeisioche pati ahụ. Ọ gara n'ihu kọwaa na dịka ya bụ okwu pụrụ ụlọikpe, na ya enwetala mmeri malite n'ụlọikpe nta ruo ụlọikpe kachasị. ""Ọ gbara m gharịị ihe mere na Inec achọghị ịnabata mkpebi ụlọikpe nyere ma kwuo na ọ bụ mụ bụ onyeisioche Apga,"" Njoku kwuru. ""Mana obi agaghị ada anyị mbọ, anyị ga na-agba mbọ iji hụ na Inec rubere isi na mkpebi ụlọikpe."" Iji saa nke, Oye gwara BBC Igbo ma boo ebubo na Njoku bụ ntisa dịka ọ na-aụta kwa mgbe oge ntuliaka ọbụla kpalite ọgbaghara na pati Apga. Ọ sị na ya bụ okwu kwesịrị ịbụ ihe ndị uweojii ga-etinye aka ma nyocha. O kwuru: ""ihe bụ ihe ọ mere n'oge ntuliaka gọvanọ Anambra nke 2021 ma tụọ asị na ahọpụtala ya dịka onye ga-azọchịtere Apga ọkwa Gọvanọ na ya bụ ntuliaka"" Oye gara n'ihu kwuo: ""Nwoke a abụghịdị onye Anambra steeti, ọ bụ onye Mbaise nke Imo steeti, kedụ onye so mee ma nyocha ọgbakọ pati a ọ sị e mere n'Owerri?"" Ọ gara n'ihu gwaa ọha ka ha ghara ige Njoku ntị ma ncha. Festus Okoye kwuru sị: ""Ọ bụrụ na ụlọikpe nye mkpebi, iwu ji Inec irube isi na mkpebi ahụ."" ""Ọ bụrụ na Inec erubeghị isi, onye ahụ nwere ikike ịgakwu ụlọikpe gwa ha na Inec na-enupu isi, ma gwakwa ha ka ha manye Inec ka ha rube isi."" ""Ọ bụrụ na nke a amịtaghị mkpụrụ, onye ahụ nwere ikike ịga gwa Ụlọikpe ha ka tụkpuo ndị isi Inec na mkpọrọ maka inupuru ụlọikpe isi."" ""Ọ bụ eziokwu na anatala akwụkwọ ahụ (nke Edozie Njoku na ndị ọkaiwu ya dere), mana kedu ụbọchị ụlọikpe kachasị nyere ya bụ mkpebi?"" ""Gịnị mere kemgbe Ọkutoba 14 2021 ruo ugbua? Gịnị mere ha ji ewetara Inec akwụkwọ mkpebi ahụ ugbua?"" ""Ọ bụrụ na ha chọọ, ha gaa gbaa Inec akwụkwọ maka nnupu isi."" Na mbido, APGA bụ otu APGA nke Chekwas Okorie malitere na abalị 22 nke ọnwa Juun 2002. Okorie natara asambodo ndebanye aha n'aka Inec n'emume nke onyeisioche Inec oge ahụ bụ Abel Guobadia,nọ n'isi ya. Esemokwu malitere n'Apga oge onyeisioche mbụ otu Chekwas Okorie na odebe ego otu ahụ bụ Victor Umeh kwarịtakwara nke mere ka a chụpụ Okorie na pati ahụ. Dike Biafra bụ Emeka Odumegwu Ojukwu banyere APGA, onwe isi e jicha malite ya ma zọkwa onyeisiala n'aha pati n'afọ 2003 ahụ mana o merighị dịka o nwetara nanị pasent 3.3 vootu a tụrụ na ntuliaka ahụ. Mana APGA nwetara oche abụọ n'ime oche 360 dị n'Ụlọomeiwu Nta. N'afọ 2007, Ojukwu zọkwara ọzọ, mana o merighị. APGA nwetara mmeri mbụ ya n'ọkwa gọvanọ n'afọ 2011 oge Rochas Okorocha zọrọ n'aha pati ahu." https://www.bbc.com/igbo/articles/cp032yy0gjvo +politics Ihe i kwesịrị ịma maka Ifeanyi Okowa dịka Atiku họọrọ ya ka ọ bụrụ osote ya "Atiku Abubakar, onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'otu 'Peoples Democratic Party' ahọrọla Gọvanọ Delta Steeti bụ Ifeanyi Okowa dịka osote ya. Nke a mere n'ụbọchị Wenezde a, abalị iri na isii nke ọnwa Jun 2022, dịka ndị isi PDP nyochachara Okowa maka ya bụ ọkwa. Ifeanyi Arthur Okowa bụ Gọvanọ nke atọ Delta steeti na-enwe kamgbe Naịjirịa laghachiri n'ọchịchị onye kwuo uche ya n'afọ 1999. Tupu ọ bụrụ Gọvanọ, ọ rụọla ọrụ na ngalaba gọọọmentị dị icheiche malite n'afọ 1991 ruo ugbua. N'ọgbakọ ndị PDP nwere n'Abuja n'ụbọchị Tọzde, Okowa sị na ya ji obi ya niile nabata nhọpụta Atiku họpụtara ya. ""Ana m ekwe nkwa na aga m agba mbọ ma kwụdosie ike n'agha a chere anyị n'ihu, nke bụ ịzọpụta obodo anyị Naịjirịa ka ọ ghara ịdakpọ."" Cheta na asịrị na-efegharibu na ọ bụ Gọvanọ Rivers Steeti bụ Nyesom Wike ka Atiku ga-ahọrọ, mana ugbua, o doola onye ọbụla anya na akụkọ ahụ bụ ụgha. Atiku kwuputara na ọ bụ Okowa ka ọ họọrọ site n'akara Twitter ya n'ehihie Tọzde. N'okwu ya n'ọgbakọ ndị PDP nwere n'Abuja na Tọzde, Atiku kọwara Okowa dịka ""onye ihe na-anụ ọkụ n'obi, onye na-enweta mmeri oge niile, onye nwere mmasị maka ezi ọchịchị, nakwa onye ihe gbasara ndị mmaọ̄ụ na-emetụta n'obi"". Chetakwa na oge Atiku zọrọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019, ọ bụ Peter Obi ka ọ họọrọ dịka osote ya. Mana ka ọ dị ugbua, Peter Obi na-azọkwa ọkwa Onyeisiala n'otu Labour Party. Peter Obi nọbụ na PDP mana ọ pụrụ banye 'Labour Party' dịka o kwuru na ọ bụ nrụrụaka a na-eme na PDP ka o ji pụọ." https://www.bbc.com/igbo/articles/c84x7gj450ko +politics Ipob nabatara Buhari 2019 Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Ihe Ipob kwuru maka mpụtaghrị Buhari na 2019 Ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Rev. Chukwudi Peace sịrị na ya bụ ebụm n'ọbị Onyeisiala bụ ihe obi ụtọ nyere ha. Okwụrụ na Biafra ga abịa nkwankwa ma ọbụrụ na Buharị chịrị gawa. Na ọbụrụ na onye ọzọ chịwa, ihe dị mma, Igbo nwere ike ị da mba ọzọ. Ihe kọmiti ọkpe udo Ọhaneze chọpụtara Kọmitii Ohaneze ndị Igbo hibere maka ị lebe anya na-ọgbaghara na-ada n'otu ahụ a ekwuola na ọ bụ ndị isi ndị ntorobia na nke ụmụnwaayị oge ha zụgoro bụ ihe malitere ọgbaaghara na otu ahụ. Ode akwụkwụ kọmitii ahụ bụ Nze ọkpani Nkama kwuru nke a na mkparita ụka ya na BBC. Ohaneze ndị Igbo ga amalite ntụliaka ndị ntorobia nakwa nke ụmụnwaanyị ha na ọgụ ụbọchị nke Ọnwa bụ Epurelu. Ihe Russia kwuru maka ogbunigwe agbara na syria Mba Russia ekwuola na ogbunigwe ahu atụrụ na Saria ụbọchị satụde bụ ogbuigwe nke nuklea. Minista Russia na ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Sergie Lavrov sị na onweghị ihe gosiri na ihe agbara ebe ahụ bụ ogbunigwe nke nuklea. N'egwuruegwu, Naịjirịa enwetala otu ọla ọcha na egwuruegwu Commonwealth nke a na-eme na mba Australia. Mba India jị ọkpụ atọ were ọla edọ etinyere na egwuruegwu tenis. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji https://www.bbc.com/igbo/afirika-43705692 +politics IGP Mohammed Abubakar Adamu: Onyeisiala Buharị agbatịala oge ọrụ ya ruo ọnwa atọ "Onyeisiala Muhammadu Buhari agbatịkwuola oge ọrụ onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu ruo ọnwa atọ ọzọ. Minista na-ahụ maka ndị uweojii bụ Mohammed Dingyadi gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Abuja n'ụbọchị Tọsde. Dingyadi sị na mgbatị a dị mkpa iji nye ohere ịhọpụta onye tozuruoke ga-anọchi anya ya. Onye ga-ewere oche IGP Mohammed Adamu dịka ọ laala ezumike nka? Ụnyahụ bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa February ka Mohammed Abubakar Adamu bụ onyeisi ndị uweojii Naịjirịa ga-ala ezumike nka. Ndị mmadụ na-atụ anya onye ga-abụ onyeisi ndị uweojii Naịjirịa ọhụrụ. Cheta na ọ bụ n'ụbọchị mbụ Jenụwarị nke afọ 2019 ka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammdu Buhari họpụtara Mohammed Abubakar Adamu dịka 'Inspector General of Police (IGP). Otu ọkpụrụkpụ ihe a ga-eji cheta Mohammed Adamu bụ ịkwụsị ngalaba ndị uweojii a kpọrọ 'Special Anti-Robbery Squad' (SARS). SARS bụ ngalaba ọtụtụ ndị mmadụ kwuru na ha na-eyi ọtụtụ ndị ntorobịa egwu site n'inwuch ndị aka ha dị ọcha nakwa iri aka azụ. Nke a butere nnukwu ngaghar��iwe na Naịjirịa nke mere Adamu ji mechie ngalaba ahụ. Mana Adamu hibekwara ngalaba ọzọ a kpọrọ SWAT bụ nke ga-anọchị anya ndị SARS. Ihe ọzọkwa a ga-eji cheta Adamu bụ atụmatụ iwulite mmekọrịta ndị uweojii na ndị obodo, nke a kpọrọ 'community policing'. Iji mee ka atụmatụ a guzosie ike, Adamu gagharịrị na mpaghara dị icheiche na Naịjiria ebe ya na ndị obodo nwere ọgbakọ etu nchekwa ga-esi kawanye mma. Mana ọtụtụ na-ekwu na atụmatụ 'community policing' amịtaghị mkpụrụ. Ụmụ Naijirịa ma ndị kwe na ndị ekweghị amanyela ọnụ gbasara onye ndu ọhụrụ e wepụtara ndị uweojii Naịjirịa bụ Mohammed Abubakar Adamu. Onyeisioche pati PDP bụ Uche Secondus dụrụ ya ọdụ ka o mezie ihe onye ndu uweojii chiburu nu bụ Ibrahim Idris mebesiri ma kwụba aka ya ọtọ. Onye ndu otu APC na Lagos steeti bụ Joe Igbokwe kwuru na ha nabatara Adamu ma gụpụtakwa ihe ole na ole ọ chọrọ ka o lebanye anya. Pati bịakọtara ọnụ a kpọrọ ""Coalition of United Political Parties"" (CUPP) n'ichafu kwuru na ha nabara na ọ ga-adịmma ka Adamu hapụ i so ụkpụrụ ụkwụ onye si n'oche ahụ pụọ. Na nchịkọta lee ihe ise ụmụ Naịjirịa na-atụ anya aka ya dịka BBC Igbo si chọpụta Ha chọrọ ka ọ kwụwa aka ya ọtọ na ntụliaka na-abịanụ, ka ọ ghara ịkwụnyere pati ọbụla karịa ibe ya. Ha chọkwara ka o wepụta ezigbo nchekwa na ntuliaka na-abịanụ ma gbochie igo vootu. Ha chọrọ ka o lebaa anya n'ihe gbasara oke ogbugbu dị n'etiti ndị ọrụugbo na ọchịehi. Ha chọkwara ka o lebaa anya na nsogbu ndị ọzọ a na-enwe gbasara nchekwa obodo Naịjirịa. Ụfọdụ ndị Igbo kwuru na ha chọrọ ka Adamu kwụsị oke ""Check points"" juru na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Ụfọdụ kwukwara na dịka etinyerela ndị uweojii ego n'ụgwọ ọnwa ha, na ọ ga-adịmma ka ha wepụta obi ha rụọ ọrụ ọfụma. Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa gụpụtara ọtụtụ ihe onye ndu Adamu nọchịrị ọkwa ya na-emetaghị ọfụma mgbe ọ nọ n'oche, ma rịokwa ya mezie ihe ndị a o mebiri nke mere ndị Naịirịa enweghị ntụkwasi na ndị uweojii. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/media-46885390 +business History of Awka: Etu Awka si bụrụ obodo e ji ịkpụ ụzụ mara Ịkpụ ụzụ bụ ihe gbara ọkpụrụkpụ e ji mara Awka, nke bụ isi obodo Anambra steeti. Omenala ọzọ e jikwa mara Ọka bụ nke a na-akpọ Imo Ọka. N'ime akụkọ a, ndị okenye nakwa eze mmụọ na-elekọta arụsị Imo Ọka kọọrọ BBC Igbo etu omenala a si malite. Ha kọwakwara ihe kpatara ịkpụ ụzụ ji bụrụ akaọrụ e ji mara ndị Ọka. Gere ya bụ akụkọ n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu. Ndị mere akụkọ a bụ Ebere Ekeopara na Vining Ogu. https://www.bbc.com/igbo/59302043 +business 'Nwa e bu n'afọ na-agba ọkada na Nnewi' - Nwaanyị ji ọgbatumtum achụ ego Dịka Mary Jane si ekwu ya, nwaanyị ịgba ọgbatumtum abụghị ihe ntabi anya ebe ya si bu Nnewi. Ọ sị na ya bịara Lagos hụ na ọ bụ nanị ụmụ nwoke na-agba ọgbatumtum. Nke a were dịrị iche n'ihe ọma na Nnewi bụ ebe ọgbatumtum bụ ihe ejiri mara ụmụnwaanyị. Nke a mere na o kpebiri na ya ga-esonye na ndị ji ya bụ atụmatu akpọrọ 'ịgba ọkada' achụ ego. Lee ihe nkiri a mata njem Mary Jane. https://www.bbc.com/igbo/afirika-50343734 +politics Nnamdi Kanu trial: Ipob ekeleela ndị mere ka a kpọpụta Nnamdi Kanu n’ụlọikpe "Otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ekeleela ndị niile mere ka a kpọpụta onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu n'ụlọikpe n'ụbọchị 21 Ọktoba, 2021. Nke a dị n'ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful wepụtara bụ ebe ha kelere ọtụtụ dị icheiche tinyere ọnụ sị ka gọọmentị hụ na Kanu bịara n'ụlọikpe. Ọ sị na mpụta n'ụlọikpe mere ka obi sie ndị Ipob na Biafra ike na onye ndu ha ka dị ndụ ma sị na gọọmentị ga-agba mbọ tọhapụ kpam kpam. Powerful kelere ndị ọkaiwu Kanu, kelee ndị ndu ala Igbo gụnyere Chukwuemeka Ezeife, Goddy Uwazuruike, ndị ntaakụkọ nakwa ndị Ipob na Biafra niile maka nkwado ha. Ọ sị na aka onye ndu ha bụ Kanu dị ọcha na gọọmentị ekwesighi ịma ya ikpe ọbụla. Powerful gakwara n'ihu kwuo ka gọọmentị etiti wepụta ụbọchị a ga-eme ntuliaka Referendum maka mwereonwe Biafra na ha adịghị na njikere ịkpa nkata ha na gọọmentị. Obi bụ anyị pọlịna pọlịna na a kpọpụtara Kanụ n'ụlọikpe taa - Ohaneze Otu Ohaneze ekwupụtala obi anwụrị ha nwere maka mkpọpụta a kpọpụtara onye ndụ otu Ipob bụ Nnamdi Kanu n'ụlọ ikpe taa bụ Tọzde. Mana otu ahụ katọrọ etu e siri gbochie ndị nnọchiteanya otu Ohaneze na ndị ntaakụkọ ịbanye ụlọikpe ịhụ ka ihe si aga sị n'ọ bụ mkparị nye Igbo. A kpụtara Kanu n'ụlọikpe maka ebubo asaa gụnyere ���kpa nkata iwepụ Ọwụwa Anyanwụ, mpaghara South South, Benue na Kogi steeti na Naijiria, iyi ndụ egwu nakwa ịkpọ oku ka a chụwa ndị ọrụ nchekwa na ndị ezinaụlọ ha dịka o si dị n'akwụkwọ ikpe nwere akara 'FHC/ABJ/CR/383/15'. N'ozi nke ọnụ na-ekwuru Ohaneze bụ Alex Ogbonnia wepụtara na mgbede Tọzde, Ohaneze kwuru na "" Obi dị anyị ụtọ na akpọtara Kanu n'ụlọikpe taa."" Ohaneze chọrọ ka gọọmentị deere otu ahụ ozi ịrịọ mgbaghara maka iletụ aka chịburu Anambara steeti bụ Chukwuemeka Ezeife na ndị okenye ọzọ Ohaneze zitere ịnọchite anya ha n'ụlọikpe. Ha na-eti mkpu sị na ha na-enyo ya bụ agwa akpasara ndị ọhaneze na ndị ntaakụkọ enyo dịka ụwa na-ele anya na e kwesịrị ikpe Kanu n'ụzọ kwụ ọtọ, na ezoghị ihe ọbụla ezo. "" Ọ bụ ihe na-atụ uche na e gbochiri ndị ntaakụkọ ohere ịbanye n'ụlọikpe maka na ụwa chọrọ ka a gbaa ihe niile n'anwụ."" Ohaneze dọrọ aka na ntị ka Gọọmentị Etiti gbasa iwu ka e si ekpe ezi ikpe n'ụwa n' ikpe Nnamdi Kanu dịka anya ụwa n'ele ha. Onye ndu otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ekwuola na aka ya dị ọcha n'ebubo a na-ebo ya dịka ọ pụtara n'Ụlọikpe Ukwu 'Federal High Court' dị n'Abuja taa bụ Tọzde. E higharịrị ikpe onye ndu otu indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu rue abalị 10 nke ọnwa Novemba, afọ 2021. Ọkaikpe jụrụ arịrịọ ka a kpọpụ Kanu n'ogige ndị DSS duga ya na mkpọrọ Kuje dịka Nyako kwuru na ọ dị mkpa ichekwa ndụ ya. Na nkọwa ya ka ọ pụtara n'ụlọikpe,ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyị Ejiofor kwuru Nnamdi Kanu saara ụlọikpe na ikpe amaghị ya n'ebubo niile e boro ya. Ejiofor kwukwara na ihe ọzọ ha nwetara n'ụlọikpe bụ ikike ndị ọkaiwu abụọ inwe ohere ị ga hụ Nnamdi Kanu ugbua bụ nke o kwuru na ndị DSS enyeghị ụdị ohere dịka ọ bụ nnanị otu ọkaiwu ka ha na anabata. O kwuru na ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu na-agbagha etu e si 'tọọrọ' Kanu na mba Kenya were kpọlata ya. E nyeghị ka ndị okenye Igbo dịka aka chiburu Anambara steeti bụ Chukwuemeka Ezeife na ndị na-anọchite Ohaneze banye ụlọikpe. Ezeife gwara BBC Igbo na a gwara ya na o nwere ohere ịbanye n'ihi na aha ya dị n'akwụkwọ mana ọ jụrụ ịbanye ebe ọ bụ na e kweghị ka ya na ndị okenye ndị ọzọ so ya. Ọtụtụ ndị ntaakụkọ na ndị ọkaiwu enweghịkwa ohere banye ụlọikpe ahụ. Ndị ihe Kanu na-amasị jụpụtakwara ụlọikpe mana e nyeghị ha ohere banye ogige ụlọikpe ahụ. Ọtụtụ n'ime ha nọ n'ama na-agụ egwu iji gosiri ọnụ na Kanu bịara ụlọikpe. Ka o si dị ugbua, Nnamdi Kanu awụchiela n'ụlọikpe ugbua. E butere Kanu n'ụgbọala SUV dị ochi n'ihe dịka elekere asatọ nke ụtụtụ. Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor ekwuola na Nnamdi Kanu awuchiela n'ụlọikpe ugbua dị n'Abuja. Ọ sị na ọ bụ naanị ya ga-aba n'ụlọikpe taa dịka a na-atụ anya onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu ịpụta n'ụlọikpe ahụ. Mana ọ kwuru na nke a agaghị eme eme. O kwukwara na ọ nọ ebe ahụ eme ngagharịwe ugbua. Ejimakor kwuru na ndị ụlọikpe chọrọ i ji ike kpụbaa ya n'ụlọikpe ebe ọ bụ na onye na-ekpe ikpe abiabeghị. A ga-amalite ikpe Nnamdi Kanu bụ onye ndu Indigenous People of Biafra ikpe n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja taa. Ọ nọọla n'ụlọ mkpọrọ DSS kamgbe ọnwa June nke afọ 2021. Gọọmentị Etiti kwuru na ha nwụchiri Nnamdi Kanu na mba Kenya n'ọnwa June ma kpọlata ya na Naịjirịa ebe a ga-ekpe ya ikpe maka ebubo ịkpa nkata ikewapụ Biafra na Naijiria nakwa ibute ogbugbu ndị mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ. Mana ndị ọkaiwu ya kwuru na ọ bụ ntọrọ ka atọrọ ya na mba Kenya n'ụbọchị June 19, 2021 ma tunye ya na mkpọrọ DSS kamgbe ahụ. Ha na-ekwusi ike na ha chọrịrị ka akpọpụta Nnamdi Kanu n'ụlọikpe taa bụ October 21,2021 bụ ụbọchị eyigharịrị ikpe ya. Cheta na ndị otu Ipob kwuru na ọ bụrụ na a kpọpụtaghị Kanu n'ụlọikpe taa dịka e si gbajọọ ikpọpụta ya n'ụbọchị Julai 26,2021 na ha ga-agbachị ebe niile na mpaghara ọwụwa anyanwụ. Kanu na-achọ nkewapụta obodo ọ kpọrọ Biafra site na mba Naịjiria nke o kwuru na atụmaatụ 'Referendum' ga-emeli. Ihe isii ndị ọkaiwu Mazi Kanu mepụtara ụnyahụ n'ọgbakọ hamaka ikpe Oct, 21 N'aka nke ọzọ, ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu kwupụtara ihe ha na-atụ anya ya na mkparịtaụka ha na ndị ntaakụkọ nwere n'Abuja taa bụ Oktoba 20, afọ 2021. Ndị mmadụ na-eche ka ha hụ ka ikpe Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu na-achọ nwereonwe a kpọrọ Indigenous People of Biafra ga-esi gaa echị bụ ụbọchị October 21, 2021. Lee ihe isii gbara ọkpụrụkpụ ndị ọkaiwu ya nọ na Naịjirịa nakwa mba ofesi kwuputere n'ọgbakọ ha kpọrọ ""World Press Briefing"" gbasara ikpe echi: Ha kwuru na ha na-ewetere ọhaneze ihe ndị dị mkpa pụtarala kamgbe e si na mba Kenya tọrọ Nnamdi Kanu n'ụbọchị June 19, 2021 ma kpọlata ya Naịjirịa. Ha kwukwara na ha na-eme ọgbakọ a maka ebubo asaa edoghị anya ọhụrụ e boro Mazi Kanu na Fraide gara aga bụ October 15, 2021. Nke a mere na: 1. Ha chọnatarịrị ka a kpọpụta Mazi Kanu echi bụ Oct 21,2021 n'ụlọikpe ka ọ bịa zara ọnụ ya. N'ọnụ ha, "" o nweghị ihe a ga-ejide aka sị na ọ bụ ya ga-eme ka aghara ịkpọpụta Kanu n'ụlọikpe ukwu echi"". 2. Ha chọrọ ka ndị ọrụ nchekwa a ga-eziga n'ụlọikpe echi bụ ụbọchị ikpe Nnamdi Kanu kpaa agwa ka mmadụ nye ndị nkịtị ga-ejupute n'ụlọikpe ị nye Kanu nkwado. Ha ruturu aka etu ndị ọrụ nchekwa si wakpoo ụfọdụ ndị biara ịnye Kanu nkwado n'ụlọikpe n'ọnwa Julai ma na-ekwu na ha achọghị ka ndị ọrụ nchekwa nye onye ọbụla nsogbu echi. 3. Ha chetara ndị ọrụ nchekwa mgbe ha kwuru na a wakporo ụlọ Mazi Kanu nakwa ndị biara ileta ya n'afọ 2015/2016 , ma na-ekwu na ha achọghị ka udiri ihe ahụ mee ọzọ tụmadị ugbua ha sị ndị mmadụ na-anọrọ n'ụlọ iji kwado ikpe Kanu. 4. Ha kwuru na ihe mere ndị mmadụ ka ji na-anọ n'ụlọ n'ụbọchị Monde ọbụla agbanyeghị na otu Ipob ekwuola ka akwụsị ya bụ maka etu ha esighị hụ Mazi Kanu ụbọchị ikpe na Julai 26, 2021, ""Ha na-eche ma ọ ka dịkwarị nke bụ ndụ."" Nke a mere ha ji na-ekwu ka atọghapụ Kanu enweghị mgbakwunye ọbụla makana aka ya dị ọcha n'ebe iwu nọ. 5. Ha kwuru ka ndị ọrụ nchekwa gbanahụ ọnọdụ ọbụla nwerike ibute mmegide ndị ọkaiwu Kanu maọbụ ndị ntaakụkọ ga-abịa ụlọikpe echi. 6. Ha kwuru na ha chọrọ ikpe kwụ ọtọ n'ebe mazi Kanu nọ ma rịọ ndị ga-abia ụlọikpe na ha kpa agwa dị mma makana ọ bụghị onye ọbụla ka a ga-ekwe ka ha banye n'ụlọikpe echi. Na ngwụcha, ha kwuru na ha ajụla ịnabata ebubo asaa ọhụrụ gọọmenti etiti boro Kanu na nso nso a." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58969669 +business Africa Free Trade Agreement: Ihe ise ị kwesiri ịmata maka atụmatụ a "N'ụbọchị Wenezde, oge ọ na- anabata onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa bịara njem nleta, onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari kwere nkwa na ya ga-ebinye anya n'akwụkwọ nkwekọrịta ka obodo 44 dị n'Afrịka na-azụ ma na ere ahịa na enweghi mgbochi ọbụla nke a kpọrọ 'African Continental Free Trade Agreement(AfCFTA)' na bekee. Cheta n'abali 21 ọnwa Maach afọ a, onyeisiala Buahari kagburu ọgbakọ mba dị na Afrịka nke a na-akpọ, 'African Union'( AU) ebe ọ kara ibinye aka na nkwekọrịta a ga-eji bido""African Continental Free Trade Area."" Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naijiria dịka onye bụbu onyeisiala, Olusegun Obasanjo, ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye(civil society groups) dịka otu SERAP katọrọ Gọọmenti Buhari maka iweghachi aka elekere azụ site na ịjụ itinye aka n'akwụkwọ ahụ. Mana, ụfọdụ otu, dịka otu jikọrọ ndị ọrụ nke a kpọrọ, 'Nigeria Labour Congress' (NLC) toro ya ma kwuo na ị ga n'ihu na nkwekọrịta a ga-ebute ịchụ n'ọrụ maọbụ mbawanye enweghị ọrụ. Na mkparịtaụka onye ntaakụkọ BBC na ọkamụta n'ihe gbasara akụnaụba nke a kpọrọ economist na bekee na mahadum, 'Lagos Business School' bụ Bongo Adi nwere, o kwuru na ọ bụ ihe dị mma na onyeisiala kpebiri itinye aka na nkwekọrịta ahụ. Mana dịka okwu a na-aga, lee ọsịsa ajụjụ ise dị mkpa na nkwekọrịta azụahịa n'Afrịka dịka Bongo Adi siri kọwa ya: 1. Gịnị bụ ""African Continental Free Trade Agreement""? Nke a bụ nkwekọrịta nke obodo dị n'Afrịka izụrịta ahịa na enweghị mgbochi ọbụla . Bongo Adi kwuru na 'Free Trade Agreement' ""bụ azụmahịa na-agara onwe ya na e nweghị mgbochi ọbụla."" Ọmụmatụ; North American Free Trade Agreement, European Union, ASEAN(Trade agreement by Association of Southeast Asian Countries) wdg. Mba 44 n'ime Mba 55 nọ n'Afrịka binyerela aka na nkwekọrịta ahụ. Obodo ndị etinyebeghị aha n'akwụkwọ nkwekọrịta ahụ gụnyere Nigeria, Benin, Botswana, Eritrea, Guinea-Bissau na Zambia. 1. Ọ ga-akwalite ọnọdụ obibi ndụ ndị Naijirịa- Dịka Ọkammụta Bongo Adi siri kọwa, ọ bụghị mba niile nwere ike imepụta ihe ndị dị ha mkpa. ""Anyị adịghị emepụta ụgbọala, na ngwa ahịa e ji arụ ọrụ (capital goods), ihe anyị nwere bụ akụ dị n'ime ala, ọ bụru na-enweghị azụmahịa, ihe ndị a agaghị abata."" 2. Ọ ga-akwalite ụlọ mmepụta ngwaahịa ka ha nwe ike na-arụpụta ihe ha ga na-ezipụ mba ndị ọzọ 3. Adi kwukwara na ọ ga-eme ka a na-emepụta ngwahịa n'ọnụ ala 4. O kwukwara na ọ ga-eme ka Naijiria na-amụta nka imepụta ihe site n'aka mba Afrịka ndị ọzọ Ọ bụrụ na e mepe ụzọ, ngwaahịa ndị mba ọzọ ga-ejuputa n'ala Naijiria mee ka ụlọ mmepụta ngwahịa Naijirii sọwa ganịganị. 5. Kedụ ụzọ e nwere ike isi gbalahụ ọghọm dị na nkwekọrịta a? O kwesighi ka emepe ụzọ fororo ka ihe ọbụla na-abata ala anyị. Bongo Adi dụrụ ọdụ sị, ""A ga na-ahọ ihe ndị a ga na-ekwe ka ọ bata. ihe ndị a na-eri eri dịka nfa-eze ( toothpick) na ihe ndị ọzọ abụghị ihe e kwesiri ka ọ na-abata.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-44806891 +politics Kingsley Moghalu: Ndị kwe ndị ekweghi so na-ebute mpụ na Naịjiria Kingsley Boseh Ayodele Moghalu bụ nwafọ Igbo bụ onye Nnewi, n’Anambra steeti, a mụrụ na Legọs steeti. Ọ ruru ọrụ na United Nations nakwa ụloakụ kachasị nke Naịjiria, dịka osote onye isi. Ọ rụkwaala ọrụ n’ọnọdụ dị iche iche na mba ofesi. Kingsley na-apụta ọzọ iso zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’ọkoloto pati African Democratic Congress (ADC) n'afọ 2023. O sobu cheere Buhari aka mgba na 2019 mgbe ha zọburu mbụ. Na mkparịtaụka a ya na BBC Igbo nwere, Moghalu tinyere ọnụ n'ọtụtụ ihe dị iche iche nke na-akpagbu obodo Naịjirịa, ihe na-ebute ha na ụzọ ọ ga-esi memilaa ha. O kwuru maka mpụ na nrụrụaka, enweghị ezi nchekwa, nsogbu dị n’agụmakwụkwọ na ihe ndị ọzọ. Ọ sị na nkewa so n'ihe na-ebute mpụ na Naịjiria. Gee ya ntị ka ọ tụnye gị azụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-60725758 +entertainment Prince Gozie Okeke: O kwuola ihe mere o ji gụọrọ dibia egwu "Gozie Okeke bụ otiegwu a ma ama na Naịjirịa ọkachasị n'etiti ndị okpukperechi Kraịst, ekwuola nke ọ sị bụ eziokwu n'okwu na-efegharị na soshal midia banyere ya ugbua. N'ihe onyonyo ọhụrụ o zipụtara n'ụtụtụ Sọnde, Okeke sara ndị na-atụ ya aka ma kpụrụ ya n'ọnụ banyere ihe onyonyo ọzọ fegharịrị n'izu gara gara ma kwuo: ""Kedụ ihe bụ nsogbu unu, sọ ihe unu ma bụ ịkatọ mmadụ ka unu abụ ndị kachasị dị nsọ..."" Dịka Gozie Okeke bụ onye na-agụ egwu ụka, aha ya abanyela n'ọtụtụ asịrị nke tetọrọ etu ndị mmadụ si ahụ ya. Mana akụkọ ọhụrụ nke a mụnyere ọkụ n'izu gara aga mgbe otu ihe onyonyo malitere fegharịwa na soshal midia. Ihe onyonyo ahụ gosiri ka Okeke na-agụ egwu na-ekwu okwu iti aka n'obi nye otu nwoke e mechara chọpụta na ọ bụ dibia afa. Egwu ọ kpụ n'ọnụ na ya bụ ihe onyonyo kwuru: ""Ma ndị nọ n'Anambra nakwa na Naịjirịa niile, unu ahụla onye na-enye ego ka Akwa?"" Ndị nọ ebe ahụ sara ya ""mba"", ọ gara n'ihu na-agụ egwu otuto nye nwoke ahụ nke ọha chọpụtara ugbua na aha ya bụ ""Akwa"". Ihe mere kpalitere ọtụtụ akụkọ dịka ndị mmadụ katọrọ ya na ọ gụrụ nwoke onye dibịa egwu otuto ebe ọ bụ onye na-agụ egwu ụka Kraịst. N'ihe onyonyo ọhụrụ a nke Gozie Okeke zipụtara n'ụbọchị Sọnde, 23 Jenụwarị, 2022, ọ kọwara ihe ọ sị bụ eziokwu banyere akụkọ a na-akpalite nkatọ aha ya. O kwuru na ihe mere bụ na e nwere ndị kpọrọ ya oku ka ọ gụọrọ ha egwu na mmeme a mere n'Oba, Anambra steeti. O kwukwara na mgbe ọ nọ n'ọrụ ịgụ egwu, na e nwere otu nwoke batara bọwaya ego nke mere o ji tuwe ya aha n'egwu ya. Na ya bụ ihe onyonyo, egwu Okeke gụrụ gosiri na ọ ma kpọmkwem onye nwoke ahụ bụ. Nke a mere ka ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na okpukperechi Kraịst anabataghị ka mmadụ kpaa ụdịrị agwa a. N'ihe onyonyo a pụtara n'akara Facebook Okeke, o gosiri na obi adighi ya mma chaa chaa maka ihe ndị mmadụ kwuru banyere ya n'egwu ọ gụrụ nwoke dibịa ahụ. O ji iwe kwuo: ""Ahụghị m ihe ọjọọ dị n'ihe m mere, Akwa bọrọ m ego, gosi m ịhụnaya nke mere m ji gụọrọ ya egwu otuto"". O jikwa iwe kwuo na ndị na-akatọ ya na-eme ka ọ bụ ha bụ ndị kacha ndị nsọ. Na ngwụcha, o kwuru na ọ ga-atụ ndị ahụ n'anya mgbe ụbọchị ikpe nke oge ikpeazụ ruo, na Akwa ga-esonye na ndị nsọ nke eluigwe, ebe ha bụ ndị nkatọ ga-anọ n'ọkụ mmụọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60105767 +entertainment Ada Success: Olileanya m bụ ịdị ka Emmanuela Ada Success bụ aha a ma ama na facebook nakwa ọgbakọ soshal midia ndị ọzọ. Ihe e ji mara ya bụ ikwu okwu na-atọ ọchị, nke na-eme ka ndị mmadụ chee na ọ bụ okenye. Mana nwaada a gbara naanị afọ ise. O kwuru na olileanya ya bụ ịdị ka Emmanuella bụkwa nwatakịrị ọzọ a ma ama na-akpa ọchị. Nne Ada Success kwuru na ya bụ nwata ejighikwa akwụkwọ ya egwu egwu, n'agbanyeghị ihe onyonyo ọ na-eme. Gere akụkọ a n'uju n'ihe nkiri dị n'elu. Ndị mere akụkọ a bụ Chukwudi Okereke na Chiemela Mgbeahuru. https://www.bbc.com/igbo/57977865 +entertainment """Anaghị m ahụ onwe ka onye nwere nkwarụ"" - Ọkpọ ụbọ na-enweghị mkpịs��� aka" "Djagbo Bishop bụ onye oti egwu; ịkpọ ụbọ nke bekee na-akpọ 'bass guitar'. Ihe nke ya ji atụ onye ọbụla n'anya bụ na o nweghị mkpịsị aka, mana onye nwere mkpịsị aka anaghị akpọ ụbọ karịa ya. Ọ bụghị naanị ụbọ ka Djagbo Bishop na-akpọ; ọ na-akụ ịgba, ọ na-akpọ 'keyboard'. Abịa n'ịgụ akwụkwọ, Bishop nwere nzere B.sc nakwa nke 'Masters'. Aka ya abụọ, nke mkpịsịaka na-adịghị, ka o ji dee ule ya niile na Mahadum Delta Steeti dị n'Abaraka, iji nweta nzere ndị a. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Djagbo Bishop kwuru na ọ bụ etu ahụ ka nne ya si mụọ ya. Mana ọzụzụ nne na nna ya nyere ya bụ ka ọ ghara ịhụta onwe ya dịka onye nkwarụ, maọbụ onye pụrụ iche n'ebe ụmụnne ya ndị ọzọ nọ. Nke a mere na oge o toruru ịmalite agụmakwụkwọ, nne na nna ya gbara mbọ chọtara ya ụlọakwụkwọ, dịka ọtụtụ ụlọakwụkwọ jụrụ ịnabata ya. Ọ bụ n'ụlọụka ka Bishop si malite njem ys n'iti egwu. ""Oge m hụtara na egwu na-amasị m, abanyere m otu ndị na-agụ egwu n'ụlọụka, wee tinye uche m n'ịmụta 'keyboard',"" Djagbo kwuru. ""Mana otu ụbọchị ka m hụrụ ebe otu nwata nwaanyị na-amụ 'bass guitar', m na-ele ya anya etu aka ya si emegharị na 'guitar' ahụ, m wee kwuo n'obi m na ihe a bụ ihe m ga-emeli."" ""Oge o debere 'guitar' ahụ, agara m bulie ya, malite ịkpọ ihe ahụ m nụrụ ọ na-akpọ. Nke a wee tụọ ndị niile nọ ebe ahụ n'anya."" Bishop kwuru na ịkpọ ụbọ eweterela ya ọtụtụ ihe ọme na ndụ ya, ""mụ na ọtụtụ ndị egwu a ma ama dịka Sinach, Frank Edwards, Buchi, etikọọla egwu""." https://www.bbc.com/igbo/articles/cxexz2d8kgyo +entertainment Jim Iyke ekwuola eziokwu niile dị ya n'ọnụ maka ndị Igbo, ejije na ndụ ya Onye ama ama na-eme ejije na Nollywood bụ Jim Iyke ekwuola hoha na nsogbu ndị Igbo nwere bụ ajọ ọchịchị. O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee 2020. Gbasara ihe o chere maka Biafra, o kwuru na ihe e ji achọrọ ya bụ atụmaatụ dị mma mana ọ bụghị ihe ga-egbo nsogbu ndị Igbo. Ọ jụrụ ma a chọta ya, ndị bu ya n'isi a ga-emeli ihe dị n'ịchị ndị Igbo? O kwuru na ndị Igbo jikọta aka ọnụ kwado onye nke nọ n'ọchịchị dịka agbụrụ ndị ọzọ si eme, a ga-enweta ezigbo ọganihu n'ala Igbo. Ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru: Gere mkparịtaụka a n'uju ebe a: https://www.bbc.com/igbo/afirika-52600478 +entertainment Igbo culture: Ụzọ isii ndị Igbo si ekpezi esemokwu oge gboo "Mgbe ọbụla mmadụ maọbụ obodo na ibe ya na-enwe mmekọrịta, esemokwu nwere ike ịdapụta n'ihi ndiiche n'echiche onye na ihe onye na-achọ mana ọ bụ e lee, a ghara ka di na nwunye ji ebi. Igbo nwere ụzọ dị iche iche e si edozi esemokwu maọbụ nghọtahie n'etiti di na nwunye, nwanne na nwanne, ezinaụlo na ezinaụlọ, ụmụnna na ụmụnna, otu na otu, maọbụ obodo na obodo. Otu onye ihe omenala doro anya bụ Durueke Ngwangene bunyere anyị uche etu ndị nna ochie si eme ya. Lee ụfọdụ ụzọ ndị gboo si edozi esemokwu dịka o siri rụtụ aka: 1. Ịṅụ iyi Iyi bụ mmadụ iji ihe karịrị ya kwe nkwa maọbụ gọrọ onwe ya na aka ya dị ọcha maọbụ na ihe a na-ebo ya abụghị eziokwu maọbụ na ọ bụ. A na-aṅụ iyi n'esemokwu dịka ịzọ ala maọbụ nnukwu ebubo. Nke a na-emekarị oge ndị ọzọ etinyechala ọnụ n'okwu ahụ mana edoziteghị ya. A na-aṅụ iyi n'arụsị, obi, maọbụ n'ala ndị ichie. Nwangene kwuru na a na-ekwubi okwu ihe ga-eme onye aka ya adịghị ọcha ma a na-aṅụ iyi. Ọ gara n'ihu gbaa akaebe maka ihe mere oge ọ dị na nwata sị, ""Ahụla m onye e mere otu a, ala tigbuo ya."" Ịgba ndụ bụ ikwe nkwa na ịgaghị eme ibe gị ihe ọjọọ. A na-eji ihe dị icheiche agba ndụ. Ụfọdụ na-eji nri agba ndụ. Ụfọdụ, mmadụ abụọ hụrụ onwe ha n'anya na-eji ọbara agba ndụ iji hụ na otu onye agaghị agbahapụ ibe ya. Mba na mba na-agba ndụ. Ndị nọ n'otu na-agbakwa ndụ. Iji maa atụ, otu mmọnwụ iji chekwa ihe nzuzo dị n'etiti ha. Otu dịga iche iche na-agba ndụ. Ọmụmaatụ, ndị nze na-agba ndụ na ị gaghị eme ụfọdụ ihe dịka; ị gaghị atụ asị, ị gaghị ezu ohi, ị gaghị awakpo nwaanyị n'ike wdg. Nwangene kwuru sị, ""A na-eji ihe dịka uriom ọkụkọ maọbụ okpete saa onye ahụ ire."" ""Ịgbachaa ndụ ahụ, ị gaghị na-ekwu okwu etu ọbụla."" 3. Ilu na ụkabụilu Ilu bụ mmanụ ndị Igbo ji eri okwu; nke a bụ ụkabụilu a ma ama. Mana ị matara na ilu bụkwa mmiri na-amari esemokwu? Ndị Igbo sị na ọ bụ ire ọma ka eju ji aga n'ogwu. N'ala Igbo, a na-eji ilu akpọdata ndị obi ha lara elu n'ihi esemokwu site na ime ka ha chebaa echiche ime, ma kpee udo. Lee ụfọdụ ilu ndị bụ igodo Igbo ji agbape ụzọ esemokwu gbachiri: a. ""Ọfọ ka ide ji awa ala."" b. ""Ire Ọma ga-ejula ji aga n'ogwu."" ch. ""Hapu ihe niile tara n'abali ka ọ bụrụ anwụ."" O nwere ụdị esemokwu e nwere ike inwe, e sie nri rikọ were dozie ya bụ okwu. Dịka Dureke Nwangene siri kọwaa, a na-akpọ ya ""akanọkụ' maọbụ ""orikọ."" ""Ọ naghị ahịa ahụ o gbuo mmadụ n'ihi na a na-ekwubi okwu tupu e rikọọ ya."" A na-ekwubi okwu tupu erie nri ahụ nye ọmụma atụ, a na-eme ụdị oriri a n'alụm nwaanyị. A na-eji ewu mee ya, ya bụ ịgba iyi na ị gaghị eme ibe gị ihe ọjọọ. N'ala Igbo oge gboo, a na-eji ihe ubi, ego, ala, anụmanụ maọbụ mmadụ nye onyinye iji dozi esemokwu. A na-eme nke a n'esemokwu dị n'etiti mmadụ na mmadụ ibe ya maọbụ obodo na obodo. Chinua Achebe n'akwụkwọ ya ọ kpọrọ 'Things Fall Apart' kọrọ akụkọ etu ndị obodo Mbaino siri nye ndị Ụmụọfịa onyinye otu nwa nwoke gbara afọ iri na ise a kpọrọ Ikemefuna. Nke a bụ iji dozie okwu pụtara ka ha gbuchara otu nwaanyị onye Ụmụọfịa were si etu ahụ gbalahụ ha na ndị Ụmụọfịa ịlụ agha. Dịka Nwangene siri kọwaa n'ala Igbo, ""Isi na Isi na-ala. I gbuhaala mmadụ n'ala Igbo, ihe ị ga-eji mechie ya bụ mmadụ."" Mgbe ụfọdụ ekpewe ikpe n'ime ụlọ maọbụ n'ama mana ekpesiteghị ya, e nweere ị ga-arụsị maọbụ na nke nwa dibịa ụjụ ese. Dịka Nwangene si kọwaa, n'ihe gbasara esemokwu ala, ""a na-eje n'arụsị maọbụ gbaa afa iji mata nke bụ eziokwu."" Kedụ ndị na-ekpezi esemokwu n'ala Igbo? Ndị ọrụ ha bụ idozi okwu n'ala Igbo gụnyere: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/54393177 +health Coronavirus Tips: Ụzọ itoolu ị ga-esi gbalahụ isi nghasa n'ihi 'lockdown' "Ọtụtụ ihe onyonyo na-egosi etu ndị mmadụ nakwa mba dị icheiche si aluso coronavirus ọgụ. Dịka ndị mmadụ nọ n' ụlọ ugbua n'ihi mmachi gọọmentị machiri mkpagharị, ihe kachasị mkpa bụ ọdịmma uche na ụbụrụisi bụ nke Bekee kpọrọ 'mental health'. Ahamefula Agomoh bụ ọkammuta n'ihe gbasara ụbụrụisi na omume mmadụ (psychiatrist) kọwara na etu ihe siri dị ugbua, ihe kachasị mkpa bụ ịzọ ndụ. Agomoh kwuru na ọtụtụ ekwetebeghị na ọrịa coronavirus bụ eziokwu. O kwuru sị: ""Ndị mmadụ ekwetebeghi na coronavirus di."" ""Ụfọdụ che na ọ bụ asị gọọmenti na-atụ iji nwee ohere ime ihe ha chọrọ ime, bụ nke Bekee na-akpọ 'conspiracy theory'."" Ọ kọwara na ị gaa n'otutu ogbe, ndị mmadụ na-agagharị ma na-egwu egwu etu ọ si sọ ha maka na ha ekwetebeghi na coronavirus dị. Agomoh kọwakwara na mgbe na-adịghị anya, ndị mmadụ ga-esita na-ekweghị ekwe baa n'iwe, n'ihi na ọ bụ kwa ụbọchị ka ọtụtụ na-akpata ihe ha na-eri. ""Ya atụla onye ọbụla n'anya ma ndị mmadụ mewe ngagharị iwe."" N'aka nke ọzọ, ọkachamara n'ihe gbasara ụzọ ibi ezi ndụ bụ Nnedimma Iwueke kọwara na ọ bụ ndị bi nanị ha, ndị ahụ na-esighị ike, ndị nweburu ọrịa ụbụrụisi nakwa ndị na-aṅụ ọgwụ ike maọbụ oke mmanya bụ ndị mmachi a ga-aka metụta ọnọdụ ahụike uche na ụbụrụ ha. Ndụmọdụ nke mbụ ha nyere bụ ka gọọmenti jiri ndị ha na ndị mmadụ na-emekọrịta oge ọbụla kuziere ha maka ọrịa coronavirus. Ha gụnyere onyeisi otu dịka 'National Union of Road Transport Workers (NURTW), ndị isi ndịahịa dị icheiche na ndị ọzọ. Ụzọ itoolu ị ga-esi gbanahụ isi nghasa n'oge mmachi a Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-52128139 +sports AFCON Group D: South Africa aghọọla Erọn gbara aka laa "Mba Saut Afrịka enwetaghị onwe ha mgbe ha zutere Ivory Coast na asọmpi bọọlụ mba Afrịka 'AFCON 2019' taa. Ivory Coast ji otu ọkpụ goolu asataghị asata wee gwa Saut Afrịka na nwoke na ibe ya ha bụ n'ọnụ. Jonathan Kodija nyere goolu ahụ na nkeji 65 wee mewaa ndi Saut Afrịka obi. Nke a pụtara na Ivory Coast na Moroko nwere akara atọ akara atọ na ""Group D"" dịka Moroko ji otu ọkpụ goolu merie mba Namibia ụnyaahụ. Saut Afrịka ga-agbazi mbọ imeri asọmpi nke ha na ndị Namibia ụbọchị Fraidee abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Juun 209. Na asọmpi nke ọzọ agbara taa, mba Angola na Tunishia nyere onwe ha otu goolu otu goolu ebe Mali na Mauritania ga-ezute onwe ha n'elekere itoolu nke abali. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48747354 +politics Anambra Governorship Election 2021: Ihe itoolu ga-ekwu onye ga-abụ gọvanọ Anambra steeti na Novemba 6 "N'abalị isii nke ọnwa Nọvemba,afọ 2021, mmadụ 18 aha ha dị n'akwụkwọ Inec wepụtara ga-esukọta mpi maka ọkwa gọvanọ Anambara steeti n'aha pati ha. Ajụjụ dị otụtụ ndị mmadụ n'ọnụ bụ onye ga-eturu ugo na ntụliaka ahụ? Mana ajụjụ a siri ike ọsịsa n'ihi na ịzọ ọkwa ọchịchị n' Anambara steeti abụghị egwu achị ụtaba n'aka agba. Ọ dị ka ịnata enwe iko e jiri kunye ya mmiri. Anambara bụ steeti e nwere ebu, nwee mfụ. Dịka otu onye okwu a kpu n'ọnụ doro anya bụ Ọkaiwu Maxwell Udechukwu siri tinye ya, ""Anambara abụghị ebe otu onye pụta o kwuo, ọ sị na otu ya kwuru ka ọ ga-adị."" Ụdị egwu ọbụla onye tipụtara, o nwere ndị nwere ike ịgba ya ma gbakarịa onye tipụtara ya. Nke a mere inweta ọkwa gọvanọ bụ ọgụ enyi na enyi; onye ga-azọgbu ibe ya? E wezụga ihe ndị a,lee ihe ụfọdụ ndị ọkachamara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na ihe na-eme n'obodo rụtụrụ aka ga-agba ama onye ịchị Anambara steeti ga-ama: Otu n'ime ihe kachasị mkpa ga-ekwu onye ga-abụ Gọvanọ Anambara steeti bụ onye kwụ onye n'azụ, ihe Bekee kpọrọ 'Godfatherism'. Dịka Ọkaiwu Maxwell Udechukwu siri sị kọwaa ya:"" Ndị Anambara nwere ndị e ji okwu ha agba izu. Anambara nwere ndị aka ji akụ rinne."" ""N'ime obodo, enwere ọtụtụ ndị na-enyere ndị obodo aka, ụdị ndị ahụ ndị be na-ele ha anya ka ha gwa ha ebe a ga-eje binye aka."" O teela aka ndị ọkaaome jiri kwuwe onye ga-achị Anambara steeti. N' afọ 1999 oge Chinwoke Mbadinuju zọtara ọkwa gọvanọ, mmụọ tiiri ya egwu bụ Emeka Offor. Na 2003 oge Dkta Chris Ngige nwetara otu ọkwa ahụ, ọ bụ Chris Ubah ka a rụrụ aka dịka ide kwụ ya n'azụ. Iji gwa gị otu nkwado ndị e ji okwu ha agba izu siri dị oke mkpa n'Anambara, ọ bụkwa onye ndu Biafra bụ Odumegwu Emeka Ojukwu nyere Peter Obi bụ onye ọtụtụ amabughị oge ahụ nkwado o jiri merie n'afọ 2010. Oge Obi chịchara agba nke mbụ ya, inweta agba nke abụọ dị ya ka ọkụkọ ịnyụ mamịrị. Nke a bụ n'ihi na agba nke mbụ Obi atụghị ndị Anambara n'anya, o ji oge ọ kara ịrụrụ ha ọrụ lụọ ọgụ dị iche iche chere ya aka mgba n'ụlọikpe nakwa ụlọomeiwu steeti ahụ. Ọzọkwa bụ na tupu oge ahụ erue, o nwebeghị gọvanọ Anambara nwetanwuru ohere agba nke abụọ; Chukwuemeka Ezeife(Jenụwarị 2, 1992- Novemba 17 1993), Chimaraoke Mbadinuju(Mee 29, 1999-Mee 29, 2003), Chris Ngige( Mee 29, 2003-Maachị 17,2006.) Ọbụladị Jim Nwobodo( 1979-1983) na Christian C Onoh(Ọktoba 1983-Disemba 1983) chịrị Anambara ochie enwetaghị ohere agba nke abụọ. Naanị arịrịọ Ojukwu rịọrọ ndị Anambara n'isi Obi tupu anwụọ bụ, ""Tụọrọnụ ya vootu, nke a bụ arịrịọ ikpeazụ m."" Ndị Anambara gere ya ntị, nye Obi vootu o ji merie. N'aka nke ọzọ, Obi dọnyere Willie Obianọ ukwu o jiri nweta ọkwa gọvanọ n'afọ 2010. Na ntụliaka na-abịa, Charles Soludo (APGA) nwere nkwado aka na-achị steeti ahụ ugbua bụ Willie Obianọ. Andy Uba (APC) nwere nkwado nwanne ya nwoke bụ Chris Ubah nakwa APC jị ọchịchị n' Etiti nakwa nke Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma. Valentine Ozigbo(PDP nwere nkwado nke Aka chịburu Anambara steeti bụ Peter Obi. Anambara steeti bụ kpọcha kpọcha steeti nwere ihe niile n'ụju; ndị gụwara isi, ndị ojiegoachụego kara aka ya mere na ndị ọrụ,ọrụ abụghị Kedụ onye onye na-azọ ọkwa bụ, ihe o merela? Ọkaiwu Maxwell sịrị, ""Ọtụtụ ndị na-azọ ọkwa gọvanọ Anambra ji ego mana ihe ga-eso kwuo onye ga-eturu ugo n'ime ha bụ ụdị mmadụ onye ahụ bụ na ihe o merala n'obodo tupu ọ pụta ịzọ ọkwa ọchịchị. ""Onye ahụ ọ bụ dịka ndị Igbo na-asị 'nwaanyị a ga-edunye mba,o rifọ nri'?"" ""Ọ bụ onye nwere aha dara ụda ka ọ bụ onye bu ego na-agagharị?"" ""Ọtụtụ ndị na-azọ ọkwa gọvanọ Anambara nwere aha mana nke ka mkpa bụ kedụ onye kachasị nwee aha site na ihe o merela ndị Anambara steeti hụrụ anya?"" Na nkọwa nke ya, Ọkaiwu Nnaji kwuru na ndị Anambara agaghị achọ ịtụrụ onye agụghị akwụkwọ nke ọma maọbụ onye na-ebute bụ mkposa obodo akwụkwọ dịka gọvanọ. Ọ sịrị na onye ndị mmadụ na-ele anya bụ: ""Ị gara akwụkwọ, gụta ya nke ọma? Ọ bụghị dọkịta e ji ego zụtara."" ""Ọ bụ onye bu ọdịmma ndị obodo n'obi? Ọ bụghị sọsọ ibu n'obi, onye merela ndị obodo ihe a hụrụ anya, n'ihi na a na-esi na kpunekpunem mara ka kpune kpune ga-adị."" ""Onye nwerela ihe iruba ama ha meerela nke na ọ bụrụ na a tụnyere ya, o mee nke karịrị ya."" Nnaji gara n'ihụ sị "" O nwere ndị ji ego mana ha na-emegbu ndị mmadụ oge mbụ, o rue ugbua, ha chọwa ịbụ gọvanọ. A gaghị elechapụ anya na nke a."" Pati onye na-azọ ọkwa gọvanọ nọ dị oke mkpa na ntụliaka n' Anambara. Nke a bụ n'ihi na ọtụtụ mgbe, ihe ndị mmadụ na-atụrụ vootu bụ pati, ọ bụghị onye na-azọ ọkwa ochịchị. Ọkaiwu Udechukwu siri kọwaa ya, ""Otu ndọrọndọrọ ochịchị onye sị pụta ga-etinye aka ikwu onye ga-az���ta gọvanọ."" Dịka Inec siri kwuo nwere pati 18 ga-esonye na ntuliaka Anambara steeti nke Novemba 6,2021, mana dịka Udechukwu sị,""otu PDP, APC, APGA nakwa YPP bụ ndị nke na-ehi ụdụ n'Anambara."" N'aka nke ọzọ, Ọkaiwu Mamah na-ele anya na ọ bụ APGA ga-enwe mmeri, n'ihi na ""Ndị Anambara na-ahụ APGA dika ""nke a bụ nke anyị"". Mana nke bụ eziokwu bụ na pati ndị ọzọ nwere agba dịka PDP na APC nwere ike ị nara ụra ụra rahụọ n'ihi nsogbu ime ụlọ dị na pati ahụ. Kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021, ọnọdụ nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ adakpọla dịka ndị omekome gbarala ọtụtụ ogige ndị uweojii na ụlọọrụ Inec ọkụ maa kwafuo ọbara ọtụtụ ndị mmadụ na mpaghara ahụ. Ọkaiwu Naijiria bụ Abubakar Malami kwuru na a gbaala ogige ndị uweojii dị 175 ọkụ ma gbuo ndị ọrụ nchekwa dị 164. Ọtụtụ na-atụ uche na ọtụtụ ndị Anambara agaghị apụta ịtụ vootu na ntuliaka a maka ịtụnye ndụ ha n'ihi egwu ndị Ipob. Ndị isi otu Ipob ekwuola ugboro ugboro na ntụliaka agaghị adị na Anambara steeti. Ha gakwaraa n'ihu tinye nọrọ-n'ụlọ otu ịzụụka malite n'abalị ise nke ọnwa Novemba rue abalị 10 nke ọnwa ahụ. Nke a bụ na-agbanyeghị na onyeisi ndi uweojii Naijiria bụ Usman Alkal Baba ekwuola na a ga-eziga ndị uweojii dị puku iri atọ na anọ n'Anambara steeti maka ntuliaka. Ndị ma ihe ekwe na-akụ kwuru na nke a ga-enye ohere ka onye ọha ndị Anambara akwadoghị nwee ike ịbụrụ gọvanọ. Ọkaiwu Cosmas Mamah sịrị: ""Ọ bụrụ naanị mmadụ iri pụtara mee ntụliaka,ị mara na ọ bụ mmadụ iri ahụ ga-ahọpụta onye ga-abụ gọvanọ."" Dịka Mamah gara n'ihu kwuo na ikpoju ndịagha na ndị uweojii agaghị ebi okwu ahụ, na ọ ka mma ka Gọọmentị etiti kpọrọ Ipob oku tupu ntuliaka Anambara. Ọzọ yiri ibe ya bụ na otu Ipob na Nnaamdi Kanu esorola na ndị na-ekwu ihe na-eme n'obodo n'anya ndị hụrụ ha n'anya maọbụ ndị kpọrọ ha asị. Ọtụtụ ndị na-azọ ọkwa n' Anambra steeti aghọtala na ọtụtụ ndị mmadụ kwụnyere n'ihe Nnamdi na otu Ipob na-ekwu banyere mmegbu a sị a na-emegbu ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ. Ọkaiwu Mamah sịrị, ""Ifeanyị Ubah gara n'ụlọikpe tinye akwụkwọ ka enye ya ohere ịhụ Nnamdi Kanu."" ""Soludo akpọbuola oku ka a tọhapụ Nnamdị Kanu."" "" Ihe ndị a niile bụ iji medaa ndị mmadụ obi ka ndị Anambara so na Ipob hụta ha dịka ndị sonyeere ha. Ọ gara n'ihu kwuo na ndị a na-azọ ọkwa nwere nkwenye na ndị na-eso Ipob na Nnamdi Kanu hụta ha dịka ndị so na ihe a na-eme, na ha agaghị enyezi nsogbu na ntuliaka. ""Ụfọdụ ndị a na-ahụta ndị ekwenyeghị na Ipob na oku nnwereonwe ka ndị ebughị Igbo ihe ọma n'obi."" ""Ya abụ ọ bụrụ na ị na-azọ ọkwa gọvanọ Anambara mana imeghị ka gị na ndị a dị na mma, ị mara na ị nọ na nsogbu."".`dddddd 7. Ego ji okwu Ịzọ ọkwa ọchịchị Naijiria bụ ego ka e ji achụ ya, nke Anambara steeti adịghị iche. E ji nnukwu ego azụ akwụkwọ achọrọ-m-ịzọ ọkwa, ịchụ nta vootu na mgbasaozi achụmnta vootu. Mana Okaiwu Mamah sịrị, ""A na-eji ego eme ntuliaka mana ọ bụchaghị ego."" ""Ọ bụghị onye ka wepụta ego kacharchịa ga-emeli, mana ego so na ihe na-ekwu."" 8. Kedụ ebumnobi onye? Ihe onye bu n'obi imere ndị Anambara ma ọ banye nke Bekee kpọrọ manifesto ga-eso kwuo onye ndị mmadụ ga-atụnyere. Ọkaiwu Nnaji kwuru na ugbua ebumnuche onye ahụ maka ndị obodo, ndị lara ezumike na ọkachasị ndị ntorobia dị ndị mmadụ mkpa. ""Kedụ atụmatụ maka udo?"" Ụfọdụ pati gbara mkpọrọgwụ na n'Anambara steetị dịka APGA na PDP nwere ọgbaghara imeụlọ nwere ike itinyere ha aja na garị na ntuliaka gọvanọ ma nye ohere ka pati ndị ọzọ dịka APC nara ha ụra rahụọ. Ọgbaghara ime ụlọ pati ndị a butere nkewa, ikpe ụlọikpe, ịgba mgba okpuru na ịwụgharị site na pati gaa na pati ọzọ. Ọmụmaatụ: Adịghị n'otu mere APGA ji nwee akụkụ abụo wepụtara ndị ga-efe ọkọlọtọ pati ahụ. Nke a meere ka Charles Soludo na Chukwuma Umeoji gawa ụlọikpe ịgbagha onye oke ahụ dịrị n'ezie. Ụlọikpe kachasị mechaara nye Soludo ikike ahụ mana a gwọcha onye ara, a naghị agwọta ya ntamụ. Nghọtahịe dị na pati ahụ ahụ ebibeghị,mere ka ụfọdụ ndị nọ na pati ahụ feere APGA aka wụbaa APC. Onye na-apụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ya. N'otu aka ahụ, na PDP, Valentine Ozigbo na Ugochukwu Uba gbaghara onye ga-efe ọkọloto pati ha were rue Ụlọikpe Kachasị ebe Ozigbo natara ikike ahụ. Mana nke bụ eziokwu bụ na ndị na-alụ ọgụ n'ugbo na-alụ, onye ji ji a na-akọnye ji n'ala. Dịka ndị Igbo si na ala adịghị mma bụ uru ndị nze. APC na pati ndị ọzọ zụọ okwe ha nke ọma, ọgbaghara dị na APGA na PDP nwere ike ịbara ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58984112 +health Chacha Eke Bipolar disorder: Gịnị ka ọ pụtara, gịnị bụ njirimara ya, kedụ etu e si agwọ ya? Onye a ma ama n'ime ihe nkiri bụ Chacha Eke pụtara n'ihe onyonyo kwuo na ọ na-arịa ọrịa ụbụrụ a kpọrọ bipolar disorder. Ọ sị na ọ bụ ọrịa a mere o ji pụta n'ihe onyonyo n'izuụka gara aga (ụbọchị atọ nke ọnwa Ọktoba, 2020) ma bo di ye ebubo iti ya ihe. Mana nwanne ya nwoke apụtala sị na nke a bụ asị na Chacha anaghị arịa ọrịa bipolar disorder. Nke a mere anyị ji atụle ihe ọrịa pụtara na njirimara ya. Nyocha ngalaba ahụike mba UK a kpọrọ 'National Health Scheme' (NHS) nyere nkọwa banyere 'bipolar disorder'. 'Bipolar disorder' bụ ọrịa na-emetụta ụbụrụ nke nwereike ịgbanwe ọnọdụ mmadụ, ọnọdụ a nwereike igbanwe site n'ogogo otu ruo nke ọzọ n'otu ntabi anya. Onye na-arịa ọrịa ụbụrụ a nwereike inwe nnukwu obi aṅụrị n'otu mgbe nke nwereike igbanwe ma bụrụ ọnọdụ nwute. Ndị na-arịa ọrịa ụbụrụ a na-ahụta ihe ndị di etu a: Onye na-arịa 'bipolar disorder' nwereike inwe mgbanwe ọnọdụ n'ime ọtụtụ izuụka. Mgbe onye ahụ na-enwe obi ịda mba, njirimara ya gụnyere: Bipolar disorder bụ ọnọdụ nwereike ịrị elu n'ogogoe kachasị. Onye na-arịa ọrịa a nwereike ọ gaghị ama mgbe o nwere oke obi ụtọ maọbụ obi ịda mba. Ọ bụrụ ha lọghachite n'onodu dị mma ọ ga-eju ha anya ụdị agwa ha kpara. O nwere ndị ọ na-eme karịa ibe ha. Ụfọdụ ndị ga na-ahụ, anụ isi maọbụ ụda ihe ndị na-adịghị ebe ahụ. O nweghi onye ma kpọmkwem ihe na-ebute ya kama ọtụtụ ihe nwereike ịkpali ya. Ọrịa ụbụrụ a bụ 'Bipolar disorder' na-emekarị ndị otu onye n'ime mmadụ narị. O nwereike ime onye nọ n'ogogo afọ ọbụla, na-agbanyeghi na ọ na-amalitekarị n'etiti afọ 15 na 19. Onye gaferela afọ 40 nwereike ọ gaghị ebutezi ya. Ọrịa ụbụrụ a nwereike ime nwoke maọbụ nwaanyị. O nwereike ime onye ọbụla. Ọ bụ dọkịta ụbụrụ isi bụ 'psychiatrist' nwereike ikwu ma mmadụ o nwere ọrịa bipolar disorder, o nweghi ọgwụgwụ mana e nwereike iji ọgwụ achịkwa ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-54467826 +religion Nsukka Mosque: A chabiri ihe onyonyo Bishop Godfrey Onah n'ụdị o ji riri ghọọ ihe ọzọ- Nsụkka Catholic Diocese "Ụka Katọlik nke Diayọsis Nsụka ekwuola na ihe onyonyo Bishop Godfrey Igwebuike Onah nke na-efegharị na soshal midia nke ụfọdụ na-arụ aka sị na ọ bụ ya butere ọgbaghara mere e jiri gbaa ụlọụka Alakụba ọkụ na Nsụka bụ nchabi ka a chabiri ya n'ụdị ka ọ ghọọ ihe ọzọ. Otu jịkọrọ ndị ụka Alakụba na Naijiria bụ 'Nigerian Supreme Council for Islamic Affairs (NSCIA) na Bekee nọrọ na nso nso a degarala onyeisi ndị uweojii Naijiria nakwa Onyeisi ndị uweojii nzuzo(DSS) akwụkwọ mkpesa sị ka e jichie Bishopụ Ụka Katọlik na Nsuka bụ Rt Rev Godfrey Onah. NSCIA na ndị Ụka Alakụba ụfọdụ weliter isi na-ebo Onah ebubo ikwu okwuchukwu kpaliri mwakpo ndị okpukerechi Alakụba na ụlọụka ha n'Ọwụwa-Anyanwụ nakwa Ndịda-Ndịda(South-South). Onye enyemaka mgbasaozi Gọvanọ Umar Abdullahi Ganduje nke Kano stteeti bụ Salihu Tanko Yakasai kwuru na ọ ga-adị mma ma ndị ọrụ nchekwa jiri Onah kuziri ndị ọzọ ihe. site na ịnwuchie ya ma kpụpụ ya ụlọikpe. Mana mkparịtaụka Odeakwụkwọ dịayọsis ahụ bụ Rev Fada Cajetan Iyiobi na BBC Igbo nwere n'ekwentị, o kwuru na a dụkọrọ ihe onyonyo ahụ n'ụzọ mere ya ka nghọta ya dị iche na ihe Bishop kwuru. Ọ sịrị, ""O nwere ahịrịokwu ị ga-ekwu, mana ewepụ ya etu isi kwuo ya mana ewepụ ya etu isi kwuo ya ọ pụta ihe ọzọ."" ""Ndị a gara were akụkọ ebe a kpọtara ụka Kraistị na ụka Alakụba aha wepụ, hapụ ihe ekwuru na mbụ nakwa ihe e kwuru na ikpeazụ."" Ọ gara n'ihu kọwaa na ọ bụ n'otu ya bụ ookwuchukwu ka Bishopụ Onah kpọrọ ndị ntorobia oku ka ha ghara itinye aka na tigbuo-zọgbuo nakwa imebi ihe ọbụla. N'okwu mkpesa otu NSCIA kpesara ma kpoo oku ka a nwụchie Onah, Fada Iyiobi kwuru na Ụka Katọlik adịbeghị njikere ịsa ya bụ okwu. "" Mgbe anyị dịrị nkwadebe anyị ga-agwa ndị ntaakụkọ."" Ka nke na-eme, otu 'Muslim Rights Concern'(MURIC) esonyela na-akpo okpu ka anwụchie Bishọpụ Onah. Onyeisi otu ahụ bụ Ishaq Akintola kwuru na ịnwụchi Onah ga-abụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị ndu ụka ga-achọ iji ụlọụka mere ebe ha na-akpalite ọgbaghara aka na ntị. Onyeisioche okpuru ọchịchị Nsụka bụ Cosmas Ugwueze agbaala ama na mmadụ anọ merụrụ ahụ n'ọgbaghara mere na Nsụka ahapụla ụlọọgwụ ebe Ndị uweojii tọhapụrụla ndị anwụchiri maka ya bụ okwu. N'ụbọchị Satode,abalị 30 nke ọnwa Oktoba afọ 2020, ọgbaghara dapụtara n'Odenigbo-Nsuka nke mere na e merụrụ ụfọdụ ndị mmadụ ahụ ma gbaa ụlọụka ndị na-ekpe ụka Alakụba ọkụ. Okwu ahụ ghọrọ okwu a kpụ n'ọnụ dịka ụfọdụ maliete ịkpọ ya ọgbaghara dị n'etiti ndị Ụka Kraistị na ndị Ụka Alakụba. Mana Ugwueze kwuru na ọgbaghara enweghị ka o siri emetụtaghị okpukperechi ọbụla. ""O nweghị onye dunyere ha gaa mee ihe ha mere. O nweghị ihe gbasara ụka n'ihe . Ọ bụ ndị na-ese okwu ego njem."" ""Onye Igbo na-anya Keke butere nwaanyị onye Awusa buru ya rue na Barracks Junction. Onye ya N100, onye Keke si na ihe ha abụọ kpebiri bụ N150."" Nwaanyị tie mkpu, ndị be ha gbaputa tiwe onye keke ihe, ọbara si ya isi na ọnụ na-apụta."" Ọ kọwara na ọ bụ ụmụ Igbo hụrụ ihe mere, ""weziri iwe webiga ya oke were gaa mebiwe ihe."" ""Anyị gbara mbọ buga mmadụ anọ ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ. Gọọmenti amalitela ịrụgharị ụlọụka Alakụba "" Ugwueze gara n'ihu kwuo na ka ọ dị ugbua, udo alọghachiela na mpaghara ahụ. Kepụkepụ BBC Igbo nwetara na-ekwu na a nwụchiri ụfọdụ ndị Ugwu nakwa ndị Nsụka maka ọgbaghara ahụ mana a tọhapụla ndị a nile. Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu bụDavid Ndukwe ekweghị aza ekwentị ya iji gwa anyị nke bụ eziokwu. Na mkparịtaụka nke ya na BBC Igbo nwere ụbọchị Tọzde, Ugwueze kwuru na ọ bụ nghọtahịe dị 'etiti onye Igbo na-anya keke na nwaanyị onye Ugwu na-ere tomatọ banyere keke ya. Ọ gara n'ihu kwuo na ha agbanyụọla ya bụ ọkụ dịka ha kpọtara ndị ọrụ bụghị mmadụ anọ bụ ihe merụụahụ bụ Otu jịkọrọ ndị ụka Alakụba na Naijiria bụ Nigerian Supreme Council for Islamic Affairs (NSCIA) na Bekee edegarala onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Mohammed Adamu akwụkwọ na-ebo Bishopụ Ụka Katọlik na Nsuka bụ Bishop Godfrey Onah ebubo ikwu okwu butere mwakpo ndị okpukerechi Alakụba nsogbu na Ọwụwa-Anyanwụ nakwa Niaja Delta. Otu ahụ na-ebo Onah ebubo ikwu okwu butere ọgbaghara mere ka awakpo ndị ụka Alakụba na Nsuka na nsonso a. Na akwụkwọ mkpesa nke Osote odeakwụkwọ NSCIA nke Salisu Shehu binyere aka, ha kwuru na ụfọdụ ndị ụka Kraistị wakporo ndị ụka Alakụba na Nsụka gbaa ụlọụka Alakụba ọkụ dịka Bishọpụ Ona gbaschara ozioma ya. Ozi ahụ kwuru sị, ""N'Ụbọchị Satọde abalị 31 nke ọnwa Ọktoba, ụfọọ̄ụ ndị ụka Kraịstị wakporo ndị ụka Alakụba na Nsuka, gbaa ụlọ Alakụba ha ọkụ n'ihi okwuchukwu nke jụpụtara okwu akpọmasị,asị nke otu Bishọpụ odfrey Igwebuike Onah ziri."" Ha gara n'ihu boo ebubo na ọ bụ okwuchukwu ya kpalitere ndị ụka ya ịwakpo ndị ụka Alakụba nakwa ụlọụka ha. Ebe ya bụ mkpamkpa ọgụ nọrọ dapụta ụbọchị satọde gara aga bụ na ogige obibindị nchekwa dị nso n'Odenigbo Nsukka. BBC mere nchọpụta na ihe kpatara ya bụ nsogbu bụ na onye ụgbọala keke na onye o bu bụ nwaanyị awụsa bụ onye ofufe alakụba nwere nhọtahie, nke kpatara na ụmụnne nwaanyị ahụ were mma makasịa onye keke ahụ. Dịka Imam na elekọta Central Mosque Nsukka Barracks bụ Yakubu Abdulahi Omeh siri kọwaa, ndị otu ya bụ onye Keke na ndị ntorobịa Nsukka chere na onye Keke ahụ anwụọla nke mere ha jiri wakpo ndị niile bụ ndị Hausa ụbọchị ahụ ma tiwe ha nnukwu ihe. Ha gbakwara ụlọ ofufe ndị alakụba abụọ dị ebe ahụ ọkụ ma mebisia ụlọ akwụkwọ. Otu Onye Keke bu Okechukwu Ome kwuru na ha chere na onye keke ibe ha anwụọla nke kpatara ha jiri mebiwe ihe ndị alakụba ahụ. Ọ kọwara na nwaanyị ahụ bụ Aisha kpọrọ ndị moslem bịara maa onye keke mma n'ihi na ha nwere nyọtahie maka ụgwọ njem ya. Ihe emebiri gunyere ụlọ ndị Alakụba abụọ agbara ọkụ, ụlọ akwụkwọ ndị na-ekuzi maka Islam nakwa ọtụtụ akwụkwọ na akụrụngwa ha ji ekpe ekpere. Bishop ndị katọliki na Nsukka bụ Bishop Onah eburularị ụzọ yọọ ndị ntorobịa ka ha hapụ imebisi ihe ma ọ bụ gbuo onye ọbụla n'ihi na omegidere iwu nke chukwu.Nnukwu ọgụ ahụ dara na Nsukka ụbọchị ole na ole gara aga n'etiti ndị okpukperechi nke Kraịst na nke alakụba abịala na njedebe mana e mebiri ọtụtụ ihe. Mbọ BBC gbara inweta ọnụ ndị uweojii amịtaghị mkpụụ n'ihi na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ David Ndukwe azaghị ekwentị ya." https://www.bbc.com/igbo/afirika-54801540 +health Coronavirus: Ihe mere m ji asachasị ebe a na-agwọ ndị bu coronavirus Damoah Asareh nwafọ mba Gana na-arụ n'ụlọọgwụ ebe a na-elekọta ndị bu coronavirua akọwala ihe ọ na-agabiga n'ọrụ ya. Ọ sị na ọ na-eme nke a iji nyere ndị a aka. Ọ kwuru na ọ bụ eziokwu na ụjọ na-atụ ya n'ọrụ a mana ndị a bụ mmadụ ibe ya. Na ọ bụrụ na ọ bịaghị, na onye ga-enyere ndị a aka? Asareh sị na nke ọzọ bụ na ọ hụrụ ọrụ ya n'anya. Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-52987470 +business Anambra Election News: Azụmaahịa ndị mere e ji a kpọ ndị Anambra 'ide ji mba' "'Ihe nke mba Naịjirịa' a na-etu ndị Anambra abụghị n'ọnụ maka na a sị na onye a na-akpọ nwere ihe ọ na-eme. Ọ dị ka a ga-asị na ndị nyere aha ahụ lebara anya n'uche ndị Anambra ma hụ na ha nwere obi e ji achụ ego, tupu ha gụọ ha aha a. A bịa n'azụmaahịa, ndị Anambra enweghi ịma atụ na Naịjirịa, ha na-agbakwụnye akọnauche ha n'azụmaahịa n'ebe ọ dị ukwuu. Akụkọ sị na Anambra Steeti nwere ọtụtụ mmadụ kachasị bụrụ ide ji mba na Naịjirịa ma bụrụkwa ndị kachasị eje mba. Kedụ ebe akọnuche azụmaahịa ha si? Otu onye omeiwu na-anọchiteanya Njikoka II n'ụlọomeiwu Anambra Steeti bụ Peter Chima Ibida sị na azụmaahịa bụ ihe e ji maara ndị Igbo niile. Ọ sị na dịka akụkọ si kwuo na ndị Igbo si n'agbụrụ ndị Juu bụ ndị e ji ime njem maara. Na ndị Igbo na-eme njem, ha ga-eji ihe ha nwereike iresi ndị obodo ahụ ha na-aga iji nwete ihe ha ga-eri ma ha ruo n'obodo ahụ. Ibida sị na ọ bụ etu ahụ ka azụmaahịa ndị Igbo si gbasaa rute ogogo ọ nọ ugbua ọkachasị nke ndị Anambra. Ọ gara n'ihu kwuo na ndị Igbo niile nwere akọnauche e ji azụ ahịa kama na ọ bụ ndị Anambra kachasị ahịa azụ n'ala Igbo niile. Ọ sị na ọ bụ nke ahụ mere 'ahia Ọnịcha' ji bụrụ ọkaibe na mpaghara Ndịda Anyanwụ Afr ika. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị Anambra malitere atụmatụ ikuziri mmadụ ka e su azụ ahịa nke e ji 'ịgba bọị' maara. Nke bụ na otu onye ga-akpọrọ ọtụtụ ndị mmadụ kuziere ahịa n'ime ọtụtụ afọ ma duo ha ụlọ site n'imepere ha ọdọ ahịa nke ha na nyekwa ha ego ha ji azụ ahịa. Na ọ bụ site n'usoro ahụ ka azụmaahịa si na-amụbawanye n'etiti ndị Anambra ma rute ndị Igbo ndị ọzọ. Maazị Ichide mere ka anyị mata na o nweghi ụdị azụmaahịa ọbụla ndị Anambra na-anọghị na ya, nke mere e ji asị na ""ihe e nweghi ike ịzụta n'ahịa Ọnịcha bụ naanị anụ mmadụ"". Mana ụfọdụ azụmaahịa ndị Anambra gbara mkpọrọgwụ na ha gụnyere; A bịa n'ihe ọbụla banyere ụgbọala nakwa ihe ndị e ji arụ ya bụ 'spare parts' ndị Anambra gbara ndị mbụ. Ị ga-anụ aha ndị dịka Coscharis Motors nke Cosmas Maduka nwe, Innoson Motors nke Innocent Chukwuma nwe na ndị ọzọ. Nke a bụ azụmaahịa ọzọ ndị Anambra ji biri ọkachasị mpaghara Nnewi. O nweghi ihe ọbụla metụtara ọgbatumtum na a gaghị ahụ n'obodo Nnewi. Aha gbapụtara ihe n'ụdịrị azụmaahịa bụ 'Ogbuawa Motocycle Spare Parts' nke P.O Ogbuawa bụ onye nwe ya, Innocent Chukwuma malitere n'ụdị azụmaahịa a tupu ọ banyer na nrụpụta ụgbọala. Nke a bụ azụmaahịa niile metụtara mmanụ ụgbọala, mmanụ a na-agbanye n'ime ingine ụgbọala nakwa ndị ọzọ. Ọtụtụ ụmụafọ ndị Anambra na-azụ ahịa mmanụ agbịdị ndị gụnyere; Arthur Eze nwere 'Atlas Oranto Petroleum, Anthony Enukeme nwere 'Tonimas Oil', Joseph Ezeokafor (Jowi Zaza) nwere 'Jezco Oil' na ndị ọzọ. Nke a bụ ngalaba azụmaahịa ọzọ e ji maara ndị Anambra na-agbanyeghi na ọtụtụ ndị ọzọ na-azụzị ya ugbua. Ị ga-ahụ ndị Anambra na-azụ ụdịrị ahịa a n'ọtụtụ ahịa dị n'ala Igbo nakwa Naịjirịa gbaa gburu gburu. Ngalaba azụmaahịa ime njem bụ ihe ọzọ ndị Anambra ji bụrụ ọpụrụiche na Naịjirịa. A bịa n'ime njem ụgbọala, ị na-ahụ aha ụlọọrụ ụgbọala dịka 'Young shall grow' nke Vincent Amaechi Obianodo nwe, 'Ekeson motors' nke Eugene Eke Nzom nwe,'GUO ' nke Godwin Ubaka Okeke nwe, 'FG Onyenwe na ọtụtụ ndị ọzọ. A bịa na njem ụgbọelu, ị ga-anụ aha ndị dịka 'Airpeace' nke Allen Onyema nwe, 'United Nigeria Airlines' nke Obiorah Okonkwo nwe. Ọ dịghị mfe ịgụpụtacha azụmaahịa niile ndị Anambra nọ n'ime ya maka na ha buru ibu. E nwere ọtụtụ ụlọahịa dị n'Anambra Steeti nke mere o ji soro na steeti ndị kachasị emepe na Naịjirịa. Ụfọdụ ahịa ndị a gụnyere; ahịa Ọnịcha, ahịa Nnewi, ahịa Ochanja, ahia Ekwulobia, ahia Ogidi, ahia Mkpor, ahia Oba, ahia Headbridge, ahia Orie Nimo, ahia Orie Agu Abagana, ahịa 'Timber' na ọtụtụ ndị ọzọ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58661891 +business South East Tourism: Lee nwoke na-egosipụta ebe ị ga-aga njem nlegharị anya n'ala Igbo Ala Igbo mara mma, e jighi Igbo agwa ya onye ọcha. Mana igosipụta mma ya bụ ọrụ Chinedu Chime kewapụtaara onwe ya. Mazi Chime kpọọrọ BBC Igbo gaa njem n'ebe abụọ dị etu a ma kọwaa ihe kpalitere mmụọ ya ịme nke a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58810407 +sports CAF Confederations Cup: Rangers Enugu akpaala ndị mmadụ obi aṅụrị "Akụkọ dị mkpa taa N'egwuregwu, Rangers International meriri otu USM BEL ABBESS nke mba Ọljiria n'asọmpi egbe buru ọ laa na nke CAF Confederations Cup, n'Enugwu. Goolu abụọ Bright Silas gbakpuru n'ọkara nke mbụ n'asọmpi ahụ nyere ha mmeri mere ka ha tozuo. Rangers ga-ezute onye ọbụla e meriri n'asọmpi agba ngwụcha nke Champions League n'egbe buru ọ laa, iji nweta ohere isonye na ""group stage"". Ebe Lobi stars meriri Gor Mahia nke Kenya iji ruo ihe Bekee kpọrọ ""Group stage"" n'asọmpi Iko Afrịka a kpọrọ CAF Champions League, nke mere ya mbụ ha na-eru ọnọdụ a kemgbe afọ 2000. Ọkụ gbara ụlọọrụ achụmnta vootu APC n'Enugwu, Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ọkụ gbara ebe George Tagbo Ogara na-azọ ọchịchị gọvanọ Enugu steeti, ji mere ụlọọrụ achụmnta vootu ya na ụgbọala abụọ. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amarizu gwara BBC na ha na-esi imi n'ala inyoputa etu ọkụ a si bido. Nzukọ Ecowas e mere n'Abuja, Na nzukọ Ecowas e mere n'Abuja, Onyeisiala Muhammadu Buhari kpọkuru ndị isiala mpaghara ọdịda-anyanwụ Afrịka ka ha jikọọ aka ọnụ mara nke e mere gbasara mpụ, ndị omekataraihepụụjọ nakwa ihe gbasara mgbanwe ihu igwe. Na nzukọ a, ha ekwuteghikwa okwu ịkpọbata mba Moroko n'ogige Ecowas dịka mba ahụ siri chọọ. Na mba ofesi, Onyeisiala mba Japan a ma dịka Emperor Akihito ekwuola ihe ga-abụ okwu ikpeazụ ọ ga-ekwu ụbọchị ncheta ọmụmụ ya n'ọha tupu ọ rịtuo n'oche n'ọnwa Epreelụ 2019. Akihito dị afọ iri asatọ na ise kwuru na ihe kacha emeda ya obi bụ na Japan agaghị agha ọzọ n'ime afọ iri atọ ọ chịchara, etu ha si gaa oge nna ya na-achị. Osinbajo o kwuru na ndị yoruba nwe oche onyeisiala n'afọ 2023? Ọtụtụ ụmụ naịjiria akatọọla okwu na-ewu na soshal midia na Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osibajo gwara ndị yoruba na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-enye ha oche onyeisiala n'afọ 2023 maọbụrụ na ha tunyere ya na ntuliaka nke 2019. Ihe na-ewu na intanet bụ na o kwuru nke a mgbe ọ gara ịleta Eze ndị Oyo steeti bụ Alaafin, Oba Lamidi Adeyemi n'ụbọchị Disemba iri abụọ na abụọ nke afọ 2018. Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa kwuru na ha kwetere n'okwu ahụ ebe ụfọdụ na-ekwu na Osote onyeisiala enweghị ike ikwu udiri okwu ahụ. Cheta na ndị dịka minista na-ahụ maka ihe gbasara ndị ọrụ na Naijiria bụ Chris Ngige , Odee akwụkwọ gọọmenti etiti bụ Boss Mustapha ,Joe Igbokwe kwuburu na ndị Igbo ga-enweta oche onyeisiala n'afọ 2023 maọbụrụ na ha tunyere onyeisiala Buhari na ntuliaka 2019. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka okwu a n'elu soshal midia @honeyandsmart kwuru na udiri okwu a ekwesighị ị pụta n'ọnụ onyeisiala makana onye ọbụla nwereike ị bụ onyeisiala n'afọ 2023 ma o merie. @Innocent_Nkire kwuru na otu Pati APC anaghị ekwu eziokwu gbasara agbụrụ ga-enweta oche onyeisiala n'afọ 2023. Mana @VillageWizards kwuru na Osote onyeisiala bụ onye na-achọ udo agaghị ekwunwu udiri okwu a. Otu na-ahụ maka ihe gbasara ndị ọrụ na Naịjirịa akpọrọ NLC n'ichafụ ekwuola na ha ga-eme ngaghariiwe n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Jenụwari ,2019, iji gosi na obi adịghị ha mma maka etu gọọmenti etiti si adọti imezu mbulite ego opekatampe ndị ọrụ Naịjirịa ruo puku naira iri atọ. Ha chọkwara ka ụlọọrụ na-enyocha mpu na nrụrụaka na Naịjirịa bụ EFCC nyocha ebubo na-ewere ego ""Paris club reFund"" nakwa ego ndị ọzọ enyere ikwado ndị steeti ịkwụ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ wee mee ihe ọzọ. N'egwuregwu, Ụkpa ekele ka na-agara onye nchịkota ọhụrụ otu egwuregwu Manchester United bụ Ole Gunnar Solskjaer, dịka ụfọdụ na-ekwu na soshal midia na ọbịbia ya mere ka ndị otu egwuregwu Man united gbasie bọọlụ ike. Egwuregwu nke mbu ndị Manchester United gbara n'okpuru Solskjaer mitara ha nnukwu mkpụrụ nke bụ na ha tiri otu Cardiff mmanwụ, site n'inye ha ọkpụ goolu ise asatara otu n'egwuregwu Premiere League ha gbara n'ụbọchị Disemba 22, 2018. N'ofesi, Ọnụ ọgụ ndị nwụrụ anwụ n'alaọmajiji Indonesia ka na-arị Ihe ruru mmadụ otu nari, iri isii na asatọ anwụọla ebe mmadụ nari asaa, iri anọ na asatọ merụrụ ahụ n'alaọmajiji mere n'Obodo Sunda Strait dị na Indonesia dịka ozi ndị ụlọọrụ ọchịchị obodo ahụ si depụta. Ụlọ ọrụ na-ahụ maka nlekọta ebe ihe mberede mere kwuru na ya bụ alaọmajiji mebiri ọtụtụ ebe obibi ndị mmadụ n'obodo ahụ. Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ututu: Ihe nkiri nke taa" https://www.bbc.com/igbo/afirika-46664542 +politics Nnamdi Azikiwe: Kedụ ihe ị ji mara 'Zik of Africa'? Nnamdi Azikiwe so n'ime otu n'ime iri a ga-akpọpụta aha ha ma a kọwa akụkọ etu Naịjirịa si nweta nnwereonwe ha n'aka ndị Briten. Azikiwe nke a na-etu 'Zik of Africa' gaara adị afọ 116 n'afọ 2020 a ma ọ bụrụ na ọ ka dị ndụ ugbua. Azikiwe tupu ọ nwụọ n'ụbọchị 11 nke ọnwa Mee afọ 1996, bụ otu nwoke kpu ọtụtụ okpu n'isi ya n'ihe gbasara dimkpa tozuru etozu. A bịa n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, o so na ndị ndị ọcha nyefere ọchịchị Naịjirịa n'afọ 1960, a bịa n'agụmakwụkwọ, ọ bụ dike; a bịakwanụ n'ogologo na mma nwoke, ọ kwụ chịm. N'ihi ụdịrị agba o nwere na Naịjirịa ka e ji nwee ihe ndị e tinyechara iji wee na-echeta ya. Ihe ndị a gụnyere ihu ya e biri n'elu ego naịra narị ise (N500), ọdọụgbọelu e si efepụ na Naịjiria dị n'Abuja, mahadum dị n'Ọka, Anambara steeti, ọgbọegwuregwu dị n'Enugwu steeti, ụlọọbaakwụkwọ dị na mahadum Nsụka, dgz. Ude ya degidere wee gafee Naịjirịa, garuo mba Tanzania ebe a gụrụ otu ụzọ dị n'obodo Dar es Salaam aha ya, nakwa otu ụlọ dị na mahadum Lincoln dị na mba Amerịka bụ nke aha ya na Kwame Nkrumah dị na ya. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50445939 +health Coronavirus Tips: Gee ntị na ndụmọdụ si n'ọnụ ụmụntakịrị Ọrịa coronavirus emeela ụwa niile ahụnanya ekwe. Ma okenye ma nwata, o nweghị ndị ya bụ ọrịa hara. Lee etu ụmụntakịrị si kọwaara BBC Igbo ihe ha ghọtara gbasara ọrịa a nakwa etu a ga-esi zeere ya. Onye mere ya bụ Ebere Ekeopara. https://www.bbc.com/igbo/afirika-52458112 +entertainment Bottled Leopard: Chukwuemeka Ike, onye na-ede akwụkwọ a ma ama, anwụọla "Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na Chukwuemeka Ike anwụọla. Ọ nwụrụ dịka ọ gbara afọ iri asatọ na asatọ n'ụlọọgwụ Nnamdi Azikiwe nke dị na Nnewi. Otu onye ma maka ọnwụ Igwe Ike sị na ""ọ nwụrụ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Jenụwarị dịka ọ rịara ọrịa obele oge."" Ọ sị na dịka ọ bụ Eze, akpọbeghị okwu ọnwụ ya aha kpọm kwem. Chukwuemeka Ike bụ Igwe na-achị Ndikelionwu dị n'okpuruọchịchị Orumba North n'Anambara steeti. Akwụkwọ e ji mara ya bụ Bottled Leopard nakwa ndị ọzọ. - Ọ mụtara nanị otu nwa aha ya bụ Osita Ike mana ọ nwụọla. - Ọ lụrụ onye Yoruba bụ Ọkammụta Adebimpe Ike. - Ọ bụ Eze Ndikelionwu dị n'Anambra steeti dịka nna mụrụ ya siri bụ - Ọ bụ ya mere ka a na-akpọ ị ghọ aghụghgọ n'ule ""Expo"" site n'akwụkwọ o dere maka ya a kpọrọ ""Expo 77"" Onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'okpuru PDP bụ Atiku Abubakar si ka mkpụrụ obi ya laa na ndokwa Uzochukwu Nkamuke kwuru etu na ọnwụ Igwe Ike wutere ya Michael Chiedoziem kwuru na ọ bụ odogwu n'odeeakwụkwọ Chioma kwuru na akwụkwọ ya Bottled Leopard bụ akwụkwọ kachasị masị ya Akụkọ ga-amasị gị" https://www.bbc.com/igbo/afirika-51067550 +business Enugu International Airport: A ga-emechi ọdụ ụgbọelu Enugwu n'Ọgọst 24 "Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naijiria amaala ọkwa na ha ga-emechi okporoụzọ ugbọelu nke dị na ogige ""Akanu Ibiam International Airport"" Enugwu bido n'abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Ọgọst. Nke a bụ iji ruzie okporoụzọ ahụ ma tinyekwa ihe ndị ọzọ ga-ewelite ọnọdụ nchekwa n'ogige ụgbọelu a. Amatabeghi izuụka maọbụ onwa ole ọ ga-ewe iji ruzie okporoụzọ ụgbọelu ahụ. Mana Henrietta Yakubu, bụ onye binyere aka n'akwụkwọ ozi nke Faan wepụtara kwuru na a ga-eme ka ọha obodo mata ma oge ruo. Akụkọ na-ekusa na soshal midia Naịjirịa bụ na aka ndị uweojii nzuzo mba Amerịka bụ FBI akparala otu nwa afọ Naịjirịa si na nwata kpaa ego. BBC ka na-eme nnyocha ịmata nke bụ eziokwu mana ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụrụ eziokwu, o bụkwa agwa ọzọ so emebi aha obodo Naịjirịa. Akụkọ na-abịa. Udo alọghachila na Sudan Na mba ofesi, e nweela nkwekọrịta pụrụ iche n'etiti ndị agha na ndị nkịtị na mba Sudan, nke ga-enye aka maka ịhazi ntụliaka n'obodo ahụ iji mee ka ndị nkịtị lọghachi n'ọchịchị. Onyeisi ndị agha bụ Abdel Fattah Abdelrahman Burhan na onye ndu ndị na-eme ngagharịiwe bụ Ahmed al-Rabie binyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịta a. Cheta na ọgbaaghara malitere na mba Sudan n'ọnwa Disemba 2018 mgbe ndị mmadụ bidoro ngagharịiwe iji chutuo Omar al-Bashir bụ onye chịrịla obodo ahụ afọ iri atọ. N'ọnwa Eprel afọ a ka ndị agha chụturu Al-Bashir, mana ngagharịiwe malitekwara ọzọ mgbe ndị agha ahụ jụrụ ịhazi ntuliaka ma nyefee ndị nkịtị ọchịchị. Liverpool na Arsenal emeriela N'egwuregwu, ndị otu egwu bọọlụ Arsenal na Liverpool agụrụla mmeri nke abụọ ha na asọmpị ""English Premier League"" nke afọ a dịka ha dulara otu egwu bọọlụ Burnley nakwa Southampton. Otu egwu abụọ a ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu wee nweta mmeri n'ụbọchị Satọdee. N'asọmpi ndị ọzọ, Bournemouth gbara Aston Villa 2-1, Everton tuuru ugo n'aka ndị Watford site n'ịgba ha 1-0. Norwich mere ihe ịtụnanya mgbe ha gbara Newcastle 3-1, ebe Brighton na West Ham gbara ọnyụpa 1-1. Manchester City na Tottenham na-achịpụ ya ugbua ịmata aka ga-agbaji aka. Okwu dị n'etiti Nigeria na P&ID Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-aga n'ụlọikpe mkpegharị maka mkpebi ụlọikpe Briten sịrị ha kwụọ ụlọorụ Process and Industrial Development (P&ID) ego dị ijeri dọla itoolu ($9bn). Ọkaiwu gọọmentị bụ Dayo Apata n'ozi ya sị na gọọmentị agwaala ndị ọkaiwu ka ha gbaa akwụkwọ megide ikpe e kpere na Lọndọn. Apata kwuru na nsogbu a bụ nke gọọmentị nọ ugbua ritere n'aka gọọmentị gara aga. Ụlọọrụ P&ID sị na ha na gọomentị etiti nwere nkwekọrịta ịrụrụ ha okporo mmanụ gaasị n'afọ 2010 mana gọọmentị emezughi nkwa nke ha. Na ọ bụ n'ihi nke mere ha ji kpọpụ gọọmentị n'ụlọikpe. Ikpe maka ụgbọmmiri mmanụ Iran Ụlọikpe mba Amerịka enyela ikike ka e jide ụgbọmmiri bu mmanụ ndị mba Ịran n'agbanyeghi na otu ọkaikpe na Gibraltar sị ka a tọhapụ ya. Ụgbọmmiri a kpọrọ Grace 1 bu barelụ mmanụ dị nde abụọ na ọma ka e jidere n'Ọnwa Julaị mgbe e che na ọ na-aga mba Syria na nzuzo. N'egwuregwu Barcelona ewerela njọahịa gbapee asọmpi La Liga nke afọ a dịka Athletico Bilbao ji otu ọkpụ goolu merie ha ụnyaahụ. Aritz Aduriz nyere goolu dị egwu iji nye Athletico Bilbao mmeri a. Nkeji" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49380231 +politics Sam Ohuabunwa: Ma PDP nye ndị Igbo ikikere ọchịchị ma ha enyeghị ha, aga m azọ ọkwa ọchịch "Maazí Ohuabunwa bụ onye na-apụta ịzọ ọchịchị onyeisiala Naịjirịa nke na-abịa na 2023. Ọ sị na ihe ya ji pụta ịzọ ọkwa ọchịchị isi ala Naịjirịa bụ ka ụmụakwụkwọ ibe ya n\ala Bekee si maa ya aka n'ihu. Ọ okwuru na ya ma nsogbu ji Naịjirịa ma jidekwa ọgwụ ya. Ọ sịkwa na ihe ji Naịjirịa dị ihe anọ; ụbịam, bụ nke ya ga-eji ịrata ọrụ mba ofe na Naịjrịa memilaa. O kwuru na ọbụghị oke na ọrụ gọomentị ịwe ndị mmadụ n'ọrụ kama ọ oke na ọrị ndị abụghị gọọmentị. Ohuabunwa sị na ""ndi a anaghị akụzị ka e sị akụta azụ, ihe ha na nye bụ azụ"". Ọ sị na dịka onye nọ so n'otu ndị na-emepụta ngwaahịa dị icheiche na ya ma nsogbo ndi n'enye ọrụ. Ọ sị na nsogbu Naịjirịa nke abụọ ya ga-ememila bụ mpụ. Ohuabunwa sị na gọomentị ya, onye ọbụla mere ajọ ihe kwesiri ị ga mkporo. Ọ sị na ọ bụ ataghị ndị mmadụ ahụhụ ka o kwesiri, mere mpụ na aghụghọ ji amabanye. Onye bụ Sam Ohuabụnwa OFR? Ohuabụnwa bụ nwaafọ Arochukwu n'Abia steeti amụrụ n'ọnwa Ọgụst 1950. Ọ gụrụ maka ịkụ ọgwụ, burukwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa onye ji ego achụ ego. Ọ bụ onye chọpụtara ma hibekwa Neimeth Pharmaceutical nakwa onyeisioche ndị Pharmaceutical Society of Nigeria. A muru ya na Port Harcourt bụkwa ebe ọ gara akwụkwọ sekọnrị na Okrika. Sam sị na ọ bụ ihe ya hụru adịghị mma na gọọmentị Nịajirịa mere ya ji puta ka ya gbanwee ya. Lee ya ka ị nụ ihe ndị ọzọ o kwuru" https://www.bbc.com/igbo/afirika-60644494 +entertainment Chris Okagbue: 'Ọ bụrụ na nna m dị ndụ, agaghị m eme ihe nkiri' Chris Okagbue na-eme ihe nkiri na Nollywood kwuru na ọ bụrụ na nna ya ka nọ ndụ , na ọ gaghị ekwe ka o mee ihe nkiri ma ncha makana ọ bụ Igwe obodo ha(Obi ofala Okagbue nke Onicha). O kwuputere ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-amaghị maka ya na ije ya na Nollywood. Kirie ya n'uju n'ihe nkiri a. https://www.bbc.com/igbo/media-51256678 +politics Nnamdi Kanu, Sunday Igboho, Obi Cubana, Tiwa Savage na ndị ọzọ Google sị kacha wuo ewu na 2021 Otiegwu Naịjirịa bụ Tiwa Savage na Obinna Iyiegbu e ji Obi Cubana mara esorola na ndị Google wepụtara n'ụbọchị Wenezde, Disemba 8, na ha kacha wuo ewu n'afọ 2021. Ya bụ akwụkwọ Google weputara maka ndị a kacha chọọ n'ọbaozi ha gụnyere ndị kacha wuo ewu, ndị egwu kacha wuo ewu, ndị agha mnwereonwe, ndị egwu bọọlụ na ndị ọzọ. Otiegwu Tiwa Savage gbara onye mbụ na ndị egwu na nke ndị na-ewu ewu nakwa ndị egwu na Naịjirịa. N'ọnwa Ọktoba, Tiwa bụ okwu a kpụ n'ọnụ maka ihe onyonyo aramara ya gbara n'anwụ. Obinna Iyiegbu a na-etu Obi Cubana bụ onye nke abụọ ya maka etu mmefu ego si wee na-arị ibe ya elu mgbe ọ kwara nne ya n'ọnwa Julaị, 2021. Nnamdi Kanu na Sunday Igboho gbara ndị atọ na nke ise n'ahịrị ahụ; nke a bụ n'ihi nnwuchi gọọmentị Naịjiria nwụchiri Kanu na-achọ nnwereonwe Biafra na Igboho na-achọ Yoruba Nation. Mmadụ iri mbụ nọ na ya bụ ahịrị n'usoro ya bụ: https://www.bbc.com/igbo/afirika-59602229 +politics Inauguration Live: Kirie ka emume idu iyi ọrụ Joe Biden dịka Onyeisiala mba Amerịka si aga Lee etu Joe Biden si aṅụ iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Amerịka nke iri anọ na isii. https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-55736398 +politics Constitution Review: Ihe ndị Ohaneeze chọrọ ka a gbanwee n'Iwu Naijiria "Otu Ohaneze Ndigbo akpọọla oku ka e kewapụta steeti ọhụrụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ma kewa Naijiria mpaghara isii. Nke a so na alo ndị ha tụpụtara n'abalị nke abụọ nke ọgbakọ maka ịnụrụ olu ọha n'okwu imegharị Iwu Naijiria nke a nwere n'Owere ụbọchị Tọzde. N'akwụkwọ ha nyere kọmiti na-ahazi mmegharị iwu Naijiria, Onyeisi Ohaneze bụ George Obiozor kwuru na ndị igbo chọọ ka enye ha otu steeti ọhụrụ, ndị uweojii steeti nakwa ịgbari ikike ọchịchị gbadata mpaghara. Ohaneze kwuru na e mee otu a na iwe na ọnụma ga-ajụrụ dịka ndị mmadụ ga-enweta oke ruru ha. Ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Alex Ogbonnia, onye gbara BBC Igbo ama a na mkparịtaụka gụpụtara ihe ndị ọzọ otu chọrọ dịka uweojii nke steeti, ""Ihe ndị Igbo chọrọ bụ e kewa steeti ọzọ, ka ọ bụrụ ndị Igbo ka e kwesịrị ikenye"" ""Ndị ọbụla were ihe dị n'ala bee ha mere ihe, ma nwee ihe ha ga na-akwụ Gọọmentị etiti."" ""Anyị chọrọ uweojii nke etiti na nke mpaghara."" ""Mpaghara ọbụla nwee ụlọikpe mkpegharị nke ha, okwu sizue ike, a gawa Ụlọikpe okpechaọgwụ"" ""Anyị chọrọ ka anyị nọrọ onwe anyị na mpaghara nke anyị ma nwekwa ohere bi na mpaghara nke ndị ọzọ."" Nzụkọ pụru iche na-ahụ maka ịhaziharị iwu Naijirịa nke bụ Constitution Review ekwuola na ha anatala atụmatụ iri anọ na asatọ gbasara ịhazịharị iwu Naijirịa. Onyeisi nzụkọ a bụ omeiwu Orji Uzọr-Kalu kwuru nke adịka ya bụ nzụkọ bịara n'isi njedebe n'Owerri, Imo Steeti. Uzor-kalụ kwuru na ha ga-elebara ya bụ iwu anya nke ọma etu ọ kwesịrị. O kwuru na ha ga-enye ndị nzụkọ ndị omeiwu ukwu na nke nta na-ahụ maka ịhazịharị iwu Naijirịa. Ọ bụ otu gụnyere Nigerian Bar association, Feminist Movement of Nigeria, Civil Society Alliance for Education, National Human Rights Commission, Women in Politics, Abia State Movement na Nigeria Union of Journalists. N'otu aka ahụ ka onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bụ George Obiozor kwuru na ihe ha chọrọ bụ "" mwere onwe n'ime Naijirịa ahazịharị"". Dịka ndị Gọvanọ Ndịda Naijiria kpọrọ oku ka Goomentị Etiti kpọọ ọgbakọ maka itinye ọnụ n'okwu gbasra ịhazịgharị Naịjirịa, ụlọomeiwu Sineti enwerela ọsọ kpọọ oku maka itinye ọnụ n'okwu gbasara ịhazigharị iwu Naịjirịa nke 1999. N'ozi ha wepụtara, ha kwuru na ha amapụtala ebe na oge ndị mmadụ ga-eji ezuko itinye ọnụ n'ihe ha chọrọ ka a hazigharịa n'Iwu Naijiria. Nke a butere ọtụtụ mmadụ ịmalite ikwu ihe gbasara imegharị iwu Naịjirịa nke Bekee kpọrọ ""Constitution"". Ọtụtụ mmadụ akpọọla ya bụ akwụkwọ aha ọjọọ na-arụ ya aka ajọo n'ụdị na ọ bụ ya bụ akwụkwọ iwu bụ isi sekpụ ntị n'ihe na-akpọtụ na Naịjrịa. Ụfodụ na-ekwu na e dere ya mgbe ndị agha na-achị bụ mgbe ha kpọbatara mmadụ ole maọbụ ole n'otu ụlọ nye ha ọrụ ịde ya bụ akwụkwọ iwu bo ya na ""we the people"" dere ya. Ebe ọtụtụ mmadụ na ndịda na-ekwu na e kwesiri ịde nke ọh uhụrụ, ndị Ugwu na-ekwu ka e degharịa ya. Nwada Igbo bụ Oby Ezekwesiri na-ekwu n'akara Twitter ya n'ụtụtụ a na ọ bụ 'constitution'ọhụrụ ka ekwesiri ị na-ekwu maka ya, ọbụghị idegharị nke ochie. Onye okaiwu bụ ọkachamara n'okwu gbasara ịme akwụkwọ iwu bụ Tony Nnadi ekwuola na ndị omeiwu Naịjrịa enweghị ikike ịdegharị akwụkwọ iwu Naịjria. Ndị omeiwu Sineti pụtara n'ụtụtụ Wenezde kwụọ na ha chọrọ ịmalite njem ịnye ọhaneze ohere ịtịnye ọnụ n'okwu gbasara ịmegharị iwu Naịjirịa. Mana Tony Nnadị bụ ọdeakwụkwọ ndị Lower Niger Congress bụ otu agburu di icheiche na Naịjirịa gbakọrọ ọnụ si na ""ndị omeiwu ahụ na ndị Gọvanọ na-aghọrọ onwe ha aghụghọ"". Ọ sị na ""ikike ndị omeiwu erughị na ịdegharị akwụkwọ iwu Naịjirịa maka na ọ bụ ya bụ akwụkwọ iwu nyere ikike ihiwe ha"". Ọ sị na ọ bụ ndị agbụrụ dị icheiche na Naịjrịa kwesiri ịgbakọta hiwe akwụkwọ iwu nke mgbe ha mechechagoro ""referendum"" n'ime onwe ha kwekọrita na ha ga-ebi. Nnadi kwuru na ""mgbe ahụ ka ya bụ akwụkwọ iwu ga-abụ nke ndị nwe ya"". Ochiedike so na gọọmentị ọnwụnwaanya mgbe Odumegwu Ojukwu chịrị bụ Mbazuruike Amachi kwetere na ndị omeiwu ahụ enweghị ike ịdagharị iwu Naịjiria. O kwuru na agbanyeghị nke a, na-akwụkwọ iwu Naịjrịa enwere ughua bụ nke adigboroja maka na ��� bụghị ndị Naịjriia dere ya. ""A ga-ede usoro ọchịchị Naịjirịa nke ọhụrụ ka ndị Naịjirịa kwuo ka ha ga-esi chia onwe ha"", dịka Mbazuruike kwuru. ""Ịdegharị akwụkwọ iwu adigboroja a dịka ịda iwu ugboro abụọ."" O sị na ọrụ ndị omeiwu bụ iji akwụkwọ iwu Naịjrịa mepụta iwu, na ọ bụghị ịdegharị ya bụ akwụkwọ. O kwukwara Tony Nnadị bụ ọkachamara gbasara akwụkwọ iwu kwuru ihe mere o ji dị mkpa ịde akwụkwọ iwu ọhụrụ. Ihe ndị a ka o kwuru: Ndị gọvanọ Ndịda amachiela ịchịgharị ehi na mpaghara ahụ iji belata nsogbu ọchịehi na mpaghara ahụ. Ndị Gọvanọ Ndịda Naịjria zukọrọ n'Asaba, Delta Steeti ụbọchị Tuzde, abalị iri na otu nke ọnwa Mee afọ 2021, tinyere ọnụ n'okwu gbasara ọdịmma, nchekwa, ndị kwe ndị ekweghi gbasara ịdịnotu Naịjrịa nakwa agha gbasara Covid-19. Ihe ndị a ka ha kpebiri: 1. Ha kwekọrịtara na ndị agbụrụ dị na ndịda kwere na idinaotu Naịjrịa nke hibere isi n'ikpe nkwumọtọ, onye biri ibe ya biri, udo na ịhụnanya na ofu obi. 2. Ndị Gọvanọ ahụ agbakọọla aka machie ichi ehi gagharịa na steeti niile ha na-achị maka mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa nke na-emetụta udọ na ịkpata akụ nke ndị mmadụ jiri biri. Ọzọ bụ na mmụbanye mmadụ mere ka ala dị ụkọ nke butere na ala ezughịzị ihe e ji ya eme na mpaghara ahụ. 3. Ha chọrọ ka gọọmentị etiti hapụ steeti chọrọ ka ha mepee usoro dị ha mma ịkpa ụmụanụ. 4. Ha kwekọrịtara na ọdị mkpa na gọọmentị etiti ga-egosi mmasị, ngwa ngwa, n'ịhazịgharị Naịjirịa n'ụdị ga-enye steeti dị iche iche ikike ịhiwe ndị uweojii nke ha, kegharịa usoro e ji eke akụnaụba Naịjirịa nke ga-egosi nke Bekee kpọrọ ""true Federalism"". Ha kwuru na ọ dị mkpa gọopmentị etiti ihebe ọgbakọ ebe a ga-anọ kpaa mkpa ọdịmma na ịdịnaotu nke Naịjirịa ngwa ngwa. 6.Ha na-akpoku gọomentị etiti ka ha ịge ntị na mkpu ndị mmadụ na-eti maka oke ruru ndị mpaghara dị iche iche maka ọkwa wenitara isi dịka ọkwa onyeisi ndị agha na nke ndị isi uweojii. Ka ha were ọsọ were iji kegharịa ha 7. Ndị Gọvanọ ahụ kpebiri ijikọọ ọnụ na ịdị n'ọtụ nke Naịjirịa. N'ihi ya, odeakwụkwọ ndị steeti niile dị na ndịda anyanwụ ga-ezuko wepụta atụmatụ ha ga-eji hiwe usoro mmekọrịta na-etiti steeti ndị a maka mmepe akụnaụba ha. 8. Ha kpebiri na gọọmentị etiti kwesiri ịmepe odoụgbọmmiri na steeti ndị ọzọ nke ga-enyeaka ka kpachịkpachị na-adị na ọdọụgbọmmiri dị n'Apapa, Legọs benata, mekwa ka ọrụ bụrụ gbanyụụ na steeti ndị a. 9. Ha dọrọ aka na ntị maka ihe ikpochi akụnaụba ọzọ maka egwu coronavirus nwereike ibute ma kwukwa ka gọọmentị etiti na nke steeti tikọo isi ọnụ wepụta atụmatụ ga-abara ọha. 10. Ndị gọvanọ ahụ dọrọ aka na ntị maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa ma kpokuo Onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ pụta gwa ụmụ Naịjirịa okwu maka ya maka ịme ha ntụkwasị obi ha na gọomentị ya gbagote. Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo steeti agaghị ọgbakọ ndị gọvanọ Ndịda Anyanwụ Naijiria mere n'Asaba Isiobodo Delta Steeti, ụbọchị Tuzde. Ọ dọghị anya ihe mere na Uzodinma ejighị bịa ọgbakọ ahụ ndị gọvanọ iri na ise si Ndịda bịara n'onwe ha. Mana Odeakwụkwọ Mgbasaozi Uzodinma bụ Oguwike Nwachukwu, kwuru na o nweghị ndajọ dị na Gọvanọ Uzodinma agaghị ọgbakọ ahụ. Ọ sịrị: ""Ọ bụ osote gọvanọ nọchitere ya. Ọ bụghị ihe ọjọọ na gọvanọ na-eziga osote ya ị ga-anọchite ya."" ""Ọ bụghị nanị ya bụ gọvanọ na-eziga mmadụ ịnọchite ya n'ọgbakọ."" Ndị gọvanọ Ndịda bịara ọgbakọ ahụ bụ: Arakunrin Oluwarotimi Akeredolu, SAN Gọvanọ Ondo Steeti Victor Okezie Ikpeazu Gọvanọ, Abia Steeti Emmanuel Udom Gọvanọ, Akwa Ibom Steeti (Osote ya bụ Moses Ekpo nọchitere anya ya) Diri Draoye Gọvanọ, Bayelsa Steeti Willie Obiano Gọvanọ, Anambra Steeti Ben Ayade Gọvanọ, Cross Rivers Steeti Ifeanyi Okowa Gọvanọ, Delta Steeti David Umahi Gọvanọ, Ebonyi Steeti Godwin Obaseki Gọvanọ, Edo Steeti John Olukayode Fayemi Gọvanọ, Ekiti Steeti Ifeanyi Ugwuanyi Gọvanọ, Enugu Steeti Hope Uzodimma Gọvanọ, Imo Steeti (Osote ya bụ Placid Njoku nọchitere anya ya) Babajide Sanwo-Olu Gọvanọ, Lagos Steeti Dapo Abiodun Gọvanọ, Ogun Steeti Isiaka Adegboyega Oyetola Gọvanọ, Osun Steeti Oluwaseyi Abiodun Makinde Gọvanọ, Oyo Steeti Ezenwo Nyesom Wike Gọvanọ, Rivers Steeti" https://www.bbc.com/igbo/afirika-57090751 +entertainment Josephine Ugwu: Nwaanyị ritere ụlọ site n'iweghachi ego ruru $12m Nwaada Josephine Ugwu ritere onyinyo ụlọ n'aka gọọmentị maka iweghachi ego ruru nde dọla iri na abụọ($12,000,000). Ọ hụrụ ego ndị a mgbe ọ na-arụ ọrụ dịka onye na-ehicha ụlọ n'ọdọụgbọala dị na Legọs. Ọ gwara BBC Igbo n'agbanyeghị na o nweghi ego na ọ bụ ịtụ egwu Chineke mere o ji weghachiri onye nwe ya ego ahụ. Josephine sị na ọtụtụ mmadụ hụtara ya dịka 'onye iberibe' mana ugbua ọ bụrụla onye nwe ụlọ nke ya. Ọ gara n'ihu nye ndụmọdụ ka ndị mmadụ nwee ndidi ma hapụ ịgbaso agwa 'a baa taa, a nwụọ echi'. Gere ihe o kwuru n'uju n'ime ihe onyonyo a: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50802088 +health Coronavirus: Ọrịa juru aka dọtị nwereike ibufere mmadụ ọrịa. Dkt Adele McCormick sị Mahadum Westminster dị na Lọndọn na-egosi ụzọ kachamma iji gbochi mbute nje ndị dịka Covid-19. Dkt McCormick gosiri anyị etu e si akwọ aka ka anyị ghara ibute nje ma ọrịa. https://www.bbc.com/igbo/51688419 +entertainment Oji otu ụkwụ agba egwu Ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjira nwere ọrụsị na-eju n’okporoụzọ na-arịọ arịrịọ, mana Doris ekwenyeghi na nke a. Ọ gwara BBC Igbo na ya agaghị esonye na ndi na-arịọ arịrịọ maka na Chukwu goziri ya. Doris kọwara na ọ bụ ọgba tum tum kụrụ ya oge ọ bụ nwata ma gbajie ya ụkwụ nke mere na ndị dibia Bekee kwuru ka e bee ya ụkwụ. O kwuru na ọ gbawara ya obi mana ya chọpụtara na ya bụ onye a goziri agozi maka na o nwere ndị enweghi ụkwụ maọbụ aka, mana ya nwere otu ụkwụ na aka abụọ. Doris si na olileanya ya bụ ịbụ onye a ma ama n’ihe nkiri site n’ime ihe onyonyo nakwa na ịgba egwu nke ụkwụ ya anaghịakwụsị ya ime. O mela ihe onyonyo ruru mkpụrụ anọ ebe ọ na-esonyekwa na ihe onyonyo egwu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-44854532 +politics Sam Mbakwe: Kedụ ihe ị ma maka ya? "Enweghi ike ịkọ akụkọ Imo steeti ma a kpọtaghị aha Samuel Onunaka Mbakwe. Mbakwe bụ otu nwoke ọtụtụ ndị hụtara ka nna ha maọbụ nwanne nna ha mgbe ọ dị ndụ ma bụrụ aka chịrị Imo steeti. Nke a mere e ji na-akpọ ya ""Dee Sam"", dịka ọ bụ nwanne onye ọbụla. Ndị ma ya mgbe ọ dị ndụ kwuru na o kwenyere na ọchịchị onye kwuo uche ya bụ maka ịrụrụ ndị mmadụ ọrụ ghara ịbụ maka naanị onwe gị (fọnfọju akpa). N'ihi ọrụ ọma niile ọ rụrụ n'Imo steeti, ụfọdụ ndị edeela akwụkwọ n'aha ya. Ndị dị ka Alphonse Okechukwu Okibedi dere akwụkwọ a kpọrọ ""Chief Sam O. Mbakwe: a great son of achievement and courage"" na Chinedum Uzoma Nwajiuba dere akwụkwọ a kpọrọ ""The glorious Mbakwe era"". Ihe ndị ọzọ gụnyekwara ọdọụgbọelu dị n'Owere, Imo steeti, nke ndị Imo steeti tụkọtara ego rụọ n'afọ 1992 ma baa ya aha Dee Sam. N'ime obi gọọmentị Imo steeti, e nwere ebe a kpọrọ ""Sam Mbakwe exco chamber"", bụ nke Rochas Okorocha rụrụ oge ọ bụ gọvanọ Imo steeti. Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abịa steeti gụharịkwara ụzọ a mabu dịka Faulks road nke dị n'Aba, ma gụọ ya Sam Mbakwe Road, n'ọnwa Maachị 2021." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59857289 +sports WWE Crown Jewel: Taa ka Tyson Fury na Braun Strowman ga-achịpụ ya Tyson Fury, dimkpa e ji iti ọkpọ mara n'ụwa niile, abanyela n'egwuregwu 'World Wrestling Entertainment'. Taa bụ ụbọchị ikpeazụ nke ọnwa Ọktoba 2019 ka ya na Braun Strowman ga-ama dimkpa na ibe ya nke ka ike. Strowman n'onwe ya bụkwa agadaga dimkpa okwu ya anaghị ekwe okwukwu. Ọgụ a bụ n'obodo Riyad nke dị na mba Saudi Arabia ka ọ ga-eme na abalị taa. Etu Fury si malite ịgba mgba Ọ bụ otu ụbọchị ebe Tyson Fury nọchapụrụ n'akụkụ na-ekiri mgba ka Strowman bịara chọọ ya okwu. Nke a ekweghi Fury odidi, o wee malie elu chọọ ịga ọgụ, mana ndị mmadụ jituru ya. N'ụbọchị ọzọ, Fury batara n'ogige ebe a na-agba mgba ma kwuo na Strowman ga-arịọ ya mgbaghara maka mkparị ọkparịrị ya. Mana Stowman gwara ya na ọ kụọla aka na gwongworo bu akpa ntu. Ha wee kabie na ha ga-achịpụ ya ka onye ọbụla mara onye karịrị ibe ya. Ọ bụ eziokwu na Tyson banyere ịgba mgba nwa mgbe nta, ọ ka na-eti ọkpọ. Ọgụ ikpeazụ ọ lụrụ bụ nke ya na Otoo Wallin n'ọnwa Sepụtemba. A na-ele anya na Fury ga-ezute Deontay Wilder, onye bụ ọkaibe n'ịkụ ọkpọ n'ọnwa Febrụwarị afọ 2020. Na 2008, Floyd Mayweather sikwa iti ọkpọ banye n'ịgba mgba. Mayweather bụ onye ama ama ji iti ọkpọ baa nnukwu ọgaranya. Ọgụ Mayweather na Big Show wuru ewu nke ukwu n'oge ahụ. Na ya bụ ọgụ, Mayweather ji ọkpọ kụpụ Big Show mkpụrụ ọkwụrụ n'anya. Nke a bụ n'agbanyeghị na Big Show bụ gbara nnukwu dịmkpa karịe ebe a tụkọtara ụdị Mayweather atọ. Mana Igbo na-atụ ilu sị na ejighi ibu oke ibu anyụ nsị ukwu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50246470 +entertainment Ndị Abatete bi na Lagos mere ihe puru iche na mmemme iri ji ọhụrụ ha Ọtụtụ ụmụafọ ndị Abatete n'ime Anambra steeti biri na Legọs steeti putara n'uju maka mme mme iri ji ọhụrụ. Ha gwara BBC Igbo na emume iri ji ọhụrụ di ezigbo mkpa n'ala Igbo, nke mere na ha na-akwadebe maka ya nke ọma afọ niile agbayeghị na ha biri na ala Legọs. Lee ihe nkiri mme mme a ugbua. Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo na Chris Sanctus Okereke https://www.bbc.com/igbo/45856933 +politics Ebonyi state gọọvernment: 'Ọ bụghị Ebubeagụ wakporo ụlọ Abia Onyike' "Gọọmenti Ebonyi steeti ekwuola na ọ bụghị ha nke ọ na-abụghị otu Ebubeagu wakporo ụlọ Abia Onyike bụbu Komishọna mgbasaozi n'Abakaliki, Ebonyi steeti Ndị bu egbe wakporo ụlọ Onyike dị n' Abakaliki n'ụzọ ụtụtụ Fraide ma wụọ mgbọ egbe ihe ruru nkeji iri atọ (30 minutes) . Onyike bụ onye otu pati na anọghị n'ọchịchị bụ People's Democratic Party (PDP) na steeti ahụ,boro ndị otu nche ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwu bụ Ebubeagụ nke Dave Umahi hiwere na steeti ahụ ebubo na aka ha dị na ya. Mana Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Uche Orji kwuru na ebubo Onyike na-ebo Gọvanọ Ụmahi bụ ụgha. ""Ndị Gọọmenti Ebonyi steeti anaghị eme otu ahụ. Anyị enweghị efe."" Dịka ndị nọ mgbe o mere siri kwuo, o nweghị onye nwụrụ maọbụ merụọ ahụ na mwakpo a mana mgbọ egbe kpọpuchara aja ma gbakaa ugegbe mpio ụlọ ahụ. Onyike, onye kwuru na ya anọghị n'ụlọ mgbe ihe ahụ mere gara n'ihu sị, gwara BBC Igbo n'ekwentị na akụkọ ahụ bụ eziokwu. ""Ndị bu egbe bu ụgbọala Siena wakporo ụlọ m n'ebe elekere abụọ nke isi ụtụtụ, gbaa egbe ihe ruru nkeji iri atọ ebe ahụ."" ""Gbakasịchaa ma windo, ma gbamgbam na ihe ndị ọzọ mana e kelre m Chineke na o nweghị onye mgbọ merụrụ ahụ. ""Mana mgbọ juru ebe niile ma na ala ma n'ime ụlọ m."" O boro ebubo sị, ""Ọ bụ ndị Ebubeagu gbara egbe ahụ, ndị mmadụ hụrụ ha n'anya. Ha ji Siena bịa."" O kwuru na ya nwetara ozi mmaja dịka ya nwechara mkparịtaụka n'otu ụlọ ntaakụkọ ụbọchị Tọzde ebe ya kwuru na ya kwadoro nchutu a chuturu Dave Umahi dịka gọvanọ. Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ezinaụlọ ya ewegarala ndị uweojii mkpesa maka mkpamkpa ahụ kpara n'ogige DPS dị n' Ochido. N' otu aka ahụ, otu Ebubeagụ gọrọ n'aka ha adịghị na mwakpo ahụ. Panchris Ikechukwu bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nke Gọvanọ Umahi n'ihe gbasara nchekwa ma bụrụkwa onye na-achịkọta Ebubeagụ na steeti ahụ kwuru na ebubo ahụ bụ ụgha. N'okwu ya ọ sị: ""Ọ bụghị eziokwu, kedụ ka Ebubeagụ bụ ndị na-echekwa obodo ga-esi bụrụ ndị bịara agba ya egbe?"" ""Ihe anyị na-eche bụ ihe ga-abara ọha ndị Ebonyi uru."" Ndị uweojii steeti ahụ gwara BBC Igbo na ha amaghị maka mwakpo ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Loveth Odah kwuru n'ekwentị, na ọ nweghị onye wetara ha mkpesa ọbụla banyere mwakpoo ahụ. ""E nweela onye kpọrọ m jụọ m maka ya bụ ihe, mana ajụọla ndị ọrụ m, e nweghị ndị wetara mkpesa ọbụla maka ya."" Odah gara n'ihu nye ndụmọdụ sị: ""Gwa ya (Abia Onyike) ka ọ ga nye mkpesa n'ogige ndị uweojii."" Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii ga-eme nnyocha ịmata ihe mere ma o mee nke a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/60708421 +entertainment Actress Doris Chima: Ihe ị kwesịrị ịma maka nwaanyị a lara mmụọ taa "Nwaanyị na-eme ejije ""Nollywood"" a ma ama bụ Doris Chima alaala mmụọ. Akụkọ kwuru na ọ bụ ọrịa akpụ kansa dulara ya mmụọ. Dịka akụkọ si kwuo, Emeka Ibe bụ onyeisi otu ndị ejije bụ Actors Guild of Nigeria (AGN) nke Legọs steeti, kwuputara na ọ nwụọla n'ezie. A mụrụ ya n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Febrụwarị 1958. Ọ bụ onye Abịa steeti. Facebook ya gosiri na ọ bụ mama nnukwu, dịka ụmụ na ụmụ ụmụ gbara ya gburu gburu. Ụfọdụ ejije ndị o mere gụnyere 'Taboo II', Divided Love', 'Sweet Mother', 'Treasure', 'Taxi Driver' 'Beauty Parlour' nakwa ndị ọzọ. O mekwara ejije a kpọrọ ""Nana of Niger Delta"". Dịka aka ochie ọ bụ, o so na ndị hibere otu jịkọrọ ndị ejije bụ ""Actors Guild of Nigeria (AGN)"", ma bụrụkwa osote onyeisi AGN nke Legọs steeti. E nwere mgbe o wuru ewu dịka otiegwu, mgbe o so mee asọmpi ndị na-agụ egwu nke ndị ụlọntaakụkọ Nigerian Television Authority (NTA) haziri n'afọ 1991. Akụkọ kwuru na ọrịa kansa mere ya ịwa, nke mere a waa ya ahụ n'afọ 2020." https://www.bbc.com/igbo/afirika-58237216 +politics Tony Anenih: Ị ma ihe jịkọrọ ya na Nnamdi Azikiwe? A mụrụ Anthony Akhakon 'Tony' Anenih na Uzenema-Arue dị n'Uromi nke Edo steeti n'afọ 1933. Ọkwa ikpeazụ o nwere bụ Minista na-ahụ maka ihe gbasara ọrụ n'ụlọ obibi n'afọ 1999 mgbe Olusegun Obasanjo rịrị ���kwa onyeisiala. Amalitere itu ya aha 'Mr Fix It' n'ihi mbọ ọ na-agba n'ihe gbasara ntuliaka ọ kachasị etu o si nye aka chiburu Edo steeti bụ Samuel Ogbemudia aka n'imeri ntuliaka ọkwa gọvanọ n'afọ 1983. Ụfọdụ ụlọntaakụkọ dị na Naịjirịa na-ekwu n'ọnwụrụ ụnya ahụ n'ụlọọgwụ dịka ọrịachara ọrịa ihe ruru otu izuụka. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị https://www.bbc.com/igbo/afirika-46015369 +business Imo State: Kedụ etu atụmatụ 'Treasury Single account (TSA) Imo ga-esi rụọ ọrụ? "Otu onye so na kọmiti hibere Treasury Single Account (TSA) n'Imo steeti bụ Bongo Adi ekwuola na ""atụmatụ TSA ga-enye aka igbochie mpụ na ohi ego steeti Imo. Ụbọchị Wenezde gọvanọ Imo bụ Emeka Ihedioha wepụtara iwu ọkụ a kpọrọ TSA nke bụ usoro nhazi ego steeti ga-eme ka ego steeti ahụ niile nọrọ n'otu akaraọba ego. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Adi kọwara na kama itinye ego steeti n'akaraọba ego dị icheiche, itinye ya n'otu ebe ga-enye aka ka anya ruo ya otu mgbe. Mgbe a jụrụ ya ma ya bụ atụmatụ a ga-enweta nsogbu n'ọrụ n'Imo steeti, Adi zara na, ""o nweghị nsogbu ọbụla ọ ga-ebute kama ọ ga-enye aka gbochie mpụ na ohi nke dị gbanyụ na gọọmenti pụrụ apụ"". O kwetara na o nwere ike iseghachi ọrụ azụ nwantii, mana ""ọka mma karịa ịhapụ mpụ na ohi ka ochie eze na steeti ahụ"". Adiị gbakwụnyere na ""nke a ga-abara ọhanaeze ndị Imo uru ma gosikwa na gọọmenti a chọrọ ịkwụwa aka ha ọtọ n'ọchịchị ha"". Site na nke a, gọọmentị ga na- esite ụlọakụ ezipụ ego ọbụla, kama inye ego n'aka n'aka. Onye ọkammụta n'ihe gbasara akụnaụba gbara ama na a ga-etinye akaraoba ego a n'aka ụlọakụ ukwu nke Naịjirịa bụ 'Central Bank' bụ ndị ga-elekọta ya anya. Adi onye bụ onye nkuzi na mahadum ama ama bụ Lagos Business School kwuru na ndị mba ndị ọzọ mepere anya na-etinye ya bụ TSA n'ọrụ kemgbe ụwa. Ọgbatauhie so TSA Adi sị na ọ bụ eziokwu na atụmatụ 'TSA' bara ọtụtụ uru mana ọ na-eme ka iwepụta ego n'akpa gọọmentị sitụọ ike maka na ọ ga-eso usoro nke ga-eme ka akwụkwọ sị n'aka fere aka were ruo ndị mmadụ aka. Africa Free Trade Agreement: Ihe ise ị kwesiri ị mata Ọrụ a nyere anyị aka ịchọpụta na Imo steeti nwere akaraọbaego dị ọtụtụ nke mmadụ amachaghị. Adi sị na ""ego di na ụfọdụ akaraọba ego a, ebe ụfọdụ tọgbọ chakoo. Ọtụtụ akaraọbaego ndị a anwụọla agbanyeghị n'ego dịcha na ha.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48957413 +business Emma Ugboaja ekwuola mgbe gọọmentị ga-ebuda ọkụ latrik Abụbụọrụ nke otu NLC na TUC kwadoro ịme na mbido izu agaghịzi ka-esi tụ anya n'ihi na ha na gọọmentị etiti nwere nzụkọ imeụlọ ma nwee mkpebi dị icheiche. BBC Igbo na onye ọdeeakwụkwọ otu NLC bụ Emma Ugboaja nwere mkparịtaụka ebe ọ kọwaara anyị ihe gọọmentị kwuru. Lee ihe o kwuru n'uju n'ime ihe onyonyo a. https://www.bbc.com/igbo/afirika-54347937 +health Coronavirus: Ihe mere m ji asachasị ebe a na-agwọ ndị bu coronavirus Damoah Asareh nwafọ mba Gana na-arụ n'ụlọọgwụ ebe a na-elekọta ndị bu coronavirua akọwala ihe ọ na-agabiga n'ọrụ ya. Ọ sị na ọ na-eme nke a iji nyere ndị a aka. Ọ kwuru na ọ bụ eziokwu na ụjọ na-atụ ya n'ọrụ a mana ndị a bụ mmadụ ibe ya. Na ọ bụrụ na ọ bịaghị, na onye ga-enyere ndị a aka? Asareh sị na nke ọzọ bụ na ọ hụrụ ọrụ ya n'anya. Akụkọ ndị ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/afirika-52987470 +entertainment New Yam Festival: Ihe mere ndị Igbo ji eme emume iri ji ọhụrụ "Ji so n'otu n'ime ihe ndị a na-akọpụta n'ala maọbụ n'ubi n'ebe ọ dị ukwuu bụ nke a na-eri ka nri. A na-ahụta ji dịka 'eze akụrụ ubi' maka na ọ bụ ihe mbụ a na-ewepụta n'oge owe ihe ubi bụ 'harvest' na Bekee. Nke a so n'ihe mere e ji akwanyere ji ugwu nke ukwuu ọkachasị ndị Igbo site n'emume 'Iri ji ọhụrụ'. Gịnị bụ 'Iri ji ọhụrụ'? Onye ọkammụta n'asụsụ Igbo bụ Chigozie Nnabuihe sị na iri ji ọhụrụ bụ emume Igbo ji ekele Chineke maka iji ji zọọ ndụ ha na-ekweghika agụụ gbuo ha. Ọ sị na ji si na nwa Igbo nke nwoke a na-akpọ Njoku topụta ebe ede si na nwa Igbo nke nwaanyị bụ Ada topụta. ""Akụkọ sị na Igbo gburu Njoku na Ada bụ ụmụ ya ma lie ha n'ala dịka Chineke si nye ya iwu. Na ụmụ Igbo a mechara topụta dịka Ji na Ede nke Chineke sị Igbo sie ha ma rie. N'ihi nke a, iji kwanyere Njoku ugwu, Igbo malitere ịna-eme emume iri ji ọhụrụ (Afoji ọkụ, Ifeji ọkụ) ka o wee kele Njoku make ezi owuwe ihe ubi nakwa rịọ maka afọ ubi ọhụrụ. Nnabuihe sị na ọ bụ nke a mere e ji agụ mmadụ aha dịka Njoku na ndị ọzọ. Emume so na nke kachasị n'ala Igbo, a na-eme ya n'ọnwa Ọgọstụ kwa afọ ọbụla iji gosi ngwụcha akụkụ ihe ubi na mmalite owuwe ihe ubi. A kpọrọ ya emume iri ji maka na ji bụ ihe akụrụ ubi mbụ a na-ewepụta n'oge owe ihe ubi. Aha ọzọ e ji maara emume a gụnyere ịwa ji, ike ji, iri ji mmiri, iro ofo, ọfala, ịhụ ji arọ dịka olu obodo dị iche iche si dị. Mpaghara Ọdịda Anyanwụ ndị ọzọ dịka mba Gana na-emekwa emume iri ji ọhụrụ. Kedụ mgbe iri ji ọhụrụ malitere? O nweghi onye maara kpọmkwem ebe maọbụ mgbe emume a malitere na-agbanyeghi na ọtụtụ obodo apụtala kwuo na ọ malitere na be ha. Mana Mazị Nnabuihe sị na emume iri ji ọhụrụ a malitere kamgbe omenala Igbo jiri malite dịka o si kọwaa na mbụ. Kedụ aja a na-atụ n'emume iri ji ọhụrụ? Obodo niile dị n'ala Igbo nwere ụbọchị nakwa usoro ha ji eme emume iri ji ọhụrụ nke ha, mana ihe gbapụtara ihe n'emume a bụ na ọ na-amalite n'ibu ụzọ gwupụta ji ọhụrụ n'ala. Ka otu ụbọchị gachaara, ndị obodo na-agbakọta n'ama bụ ebe a ga-anọ tụọ aja, gọọ ọfọ nakwa kpee ekpere. Onye na-eme nke a nwereike ịbụ Eze obodo, onyeisi njụ aja maọbụ onye okenye katara ahụ n'obodo ahụ. Aja, ọfọ na ekpere a na-ekpe bụ iji keele chi ọbụla ha na-efe maka ndụ o nyere, owe ihe ubi ọma nakwa ịrịọ ka afọ ọzọ na-abịa kara mma. N'oge emume a, a na-awa ji ma tụpụ ya n'ala iji kwanyere chi ala bụ 'Afajioku' nakwa ndị nna nna ochie ugwu. Ndị egwu ọdịnala, ekpo, mmọnwụ dị iche iche ga-apụta n'ama gbaa egwu ma mee ihe ngosi n'emume iri iji ọhụrụ a. Kedụ ụdịrị nri a na-eri n'emume a? A chụchaa aja a, ezinaụlọ ọbụla si n'obodo ahụ ma ndị bi n'ụlọ mana ofesi ga-enwezi ohere iri ji ọhụrụ. Nri ọbụla a na-eri n'oge a bụ nri e mepụtara site na ji nke gụnyere ahụrụ ahụ ji, ji mmiri ọkụ, asụrụ asụ ji dgz. Nke akụrụngwa e ji eri ha gụnyere ofe a kwọrọ aka sie, mmanụ nri, nnu, ose na yabasị. Kedụ ihe dị iche n'emume iri ji ugbua? Obere ihe ndịiche dị n'etu e si eme emume iri ji mgbe gboo na nke ugbua bụ na ndị Igbo bi n'ofesi nakwa obodo ọzọ na-ahụghị ala Igbo na-emezi emume iri ji ọhụrụ. Ha na-eme nke iji gosi nkwanye ugwu n'ebe omenala Igbo nakwa ji nọ. Ọ pụtakwara na iri ji agazuola mbaụwa. Ọzọ bụkwa na ụfọdụ ndị ụka Kraịst akọrọla emume iri ji ọhụrụ tinye n'ofufe ha iji gosi etu omenala a ji dị mma ma baa uru. Kedụ uru emume iri ji ọhụrụ baara? Emume iri ji ọhụrụ baara ndị Igbo uru n'ebe o buru ibu nke gụnyere;" https://www.bbc.com/igbo/afirika-58225387 +health Monkeypox virus: Gịnị bụ Monkeypox? "Achọtala ọrịa monkeypox n'ahụ onye ọzọ na mba Briten, Ka anyị lebanye ọrịa pụrụiche anya. Monkeypox o juru ebe nille? Ọ bụ nje Monkeypox na-ebute ọrịa monkeypox, ya na ọrịa kịtịkpa nwere otu nje na-ebute ha kama monkeypox anaghị enye nsogbu ka kịtịkpa ebe ndị sayensi na-ekwu na anaghị enweta ya kwadaa. Ọ bụ n'ime obodo dị na mpaghara etiti na ọdịda anyanwụ Afrịka, ebe ndị nọ ọhịa nso. Nje a nwere agba abụọ nke bụ 'West African' na 'Central African'. Mmadụ abụo a si Naijirịa bata Briten, ọ dịka ha a na-arịa nke agba West Africa nke echere anaghị enye oke nsogbu kama amatachabeghị nke bụ eziokwu. Onye nke atọ bụ onye ọrụ gbata gbata butere ya n'aka onye na-arịa ọrị a. Kama mmadụ anọ butere ya nsonso a enweghị etu ha na ndị butere ya na mbụ siri nwee mmekọ. UKHSA na-ekwu na onye ọbụla chere na obutela ya gaa ahụ onye ọrụ ahụike ma kpọọ ụịloọgwụ tupu ha agawa. Njirimara ọrịa a? Njirimara mbụ ọrịa a gụnyere ahụ ọkụ, isi ọwụwa, ahụ ozịza, azụ mgbu, ahụ mgbu na ịchere ụkwụ na mmadụ anọkwuteghị otu ebe. Mgbe ahụ ọkụ bidoro, ọkọ ahụ nwereike ipụta, ọ na-ebidokarị n'ihu, site ebe ahụị gbasaa akụkụ ahụ ndị ọzọ, kachasị aka na ichere ụkwụ. Ọ na-akọ oke ọkọ. O na-ejikarị aka ya ala n'ime ụbọchị 14 na 21. Kedụ etu esi ebute ya? Mmadụ nwereike ibute Monkeypox ma ya na onye nwe ya nwee mmekọ. Ọrịa nwereike isite n'ọnya ahụ, ebe esi eku ume, anya, imi maọbụ ọnụ banya ahụ onye ọzọ. Mmadụ nwereike ibute ya site na mmetụ oge mmekọ nwoke na nwaanyị. Anụmanụ dịka enwe, oke na ụsa maọbụ ihe ọbụla nje a metụtara nwereike ịbunye mmadụ ọrịa a. Kedụ etu ọrịa siri dị njọ maka ahụike? Ọtụtu mgbe, ọrịa a anaghị adị njọ ọ na-eji aka ya ala n'ime izuụka olemaole. Monkeypox a nwereike ịkanwanye njọ dịka akụkọ na-ekwu na ogbuola ụfọdụ ndị mmadụ na mpaghhara ọdịda anyanwụ Afrịka. Ugboro ole ka ọ na-etiwapụta? Ọ bụ n'ahụ enweka ebu ụzọ hụ ya, mana kamgbe afọ 1970, anụla maka ya na mba iri dị n'afrịka. Ọ bụ na mba Amerịka n'afọ 2003 ka ahụtara ọrịa na mbụ na mba na-anọghị n'Afrịka. Ọ bụ ndị ha na anụmanụ ndị bu ọrịa nwere mmekọ butere ọrịa a dịka mmadụ 81 butere ya na mba Amerịka. Ọ bụ n'afọ 2017 ka mmadụ 172 butere ya na Naijirịa ebe 75% n'ime ha dị site afọ 21-40. Ọgwụgwọ Monkeypox? Ọrịa a enweghị ọgwụgwọ, kama enwereike ịkwụsị mfesa ya. Ọgwụ mgbochi monkeypox nwereike iji 85% gbochie ya. Obi ekwesịrị ịmapụ anyị? Ndị ọkaibe na-ekwu na orubeghị ọnọdụ ozurumbaọnụ. Prof Jonathan Ball, bụ ọkaibe na molecular virology, nke mhadum Nottingham kwuru sị, : "" Ebe ọ bụ naanị otu onye n'ime mmadụ 50 ha na ọrịa nwere mmekọ butere ha na-egosi na ya bụ ọrịa anaghị efesa n'ike"" . Dr Nick Phin, bụ osote onyeisi, National Infection Service nke Public Health England (PHE), kwuru sị: "" Ọ dị mkpa ka ndị mmadụ mata na ọrịa mpnkeypox anaghị eji ike efesa n'etiti ndị mmadụ ma etu ọ ga-esi emetụta ahụike ndị ọha ebughị ịbụ"". PHE na ndị ha na onye nwere ọrịa nwere mmekọ na-akparịta ụka iji nye ha ezigbo ndụmọdụ na ihe ndị ọzọ dị mkpa"". Ebe akụkọ a si: PHE England and World Health Organization." https://www.bbc.com/igbo/afirika-61556306 +religion Catholic priest killing: E gbuola ụkọchụkwụ Katọlik ọzọ, gbaa ozu ya ọkụ "Ndị uweojii Taraba steeti kwuru na ha na-eme nnyocha iji nwụchie ndị gburu ụkọchụkwụ ma gbaa ozu ya ọkụ na Taraba steeti. Akụkọ kwuru na ndị a mabeghị ndị ha bụ gburu Fada David Tanko nke ụlọụka St.Peters Catholic Church, Amodu, dị n'okpuru ọchịchị Takum, Taraba steeti, oge ya na ndị ogbo ya na-aga maka mkpezi ikpe dị n'etiti ndị Jukun na ndị Tiv ụbọchị Fraide n'ime obodo Kpankufu n'ụzọ Wukari. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Taraba bụ David Misal, gwara BBC Igbo na ya bụ ọdachi mere n'ezie. Ọ gara n'ihu kwuo, ""Anyị na-esi imi n'ala inweta ndị kpara mkpamkpa ahụ."" Ka ọdị ugbua, onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Adamu Mohammed enyela kọmishọna uweojii Taraba iwu ịchọta ndị mere ya bu ihe. O nyekwara ndị kọmịshọna ndị uweojii nọgasị na steeti dị icheiche iwu ilebanye pụụ iche na nchekwa ndị ụkọchukwu. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49511878 +health Madagascar Coronavirus: Gịnị dị n'ime ọgwụ ọhụrụ a azụtara na Madagascar? "Dịka gọọmentị Naịjirịa nyere iwu ka a tụbata mgbọrọgwụ nke e mepụtara na mba Madagascar iji gwọọ ọrịa coronavirus, ọ bụrụla akụkọ na-ewu ewu ebe niile. Ụfọdụ mmadụ dịka otu onye Dọkịta bụ McGinger Ibeneme kwuru na ọ ga-adị mma itule ya bụ ọgwụ dịka Minista ahụike bụ Osagie Ehanire si kwuo. O kwuru nke a n'ihi na n'ọnụ ya ""Coronavirus anyụọla mbaụwa niile ịkpakwụ"" ya mere a ga-eji chọọ ọgwụgwọ ọsịsọ. Ngalaba ahụịke bụ World Health Organisation (WHO) na-adọkwa aka na ntị ka e mee ọgwụ ahụ nnyocha mara ma ọ ga-adị mma n'ime ahụ mmadụ tupu e nye ya onye bu ọrịa a. Kedụ ka o si atọ? Lee ihe anyị ma:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-52631191 +politics Independence Day Nigeria: Naịjirịa n'afọ 60 ọ nọ n'udo? Ndị mmadụ ekwuola uche ha banyere ọnọdụ Naịjirịa nọ ugbua dịka ọ gbarala afọ iri isii. BBC Igbo gbara ọtụtụ ụmụ Naịjirịa ajụjụọnụ, ha kọwara etu ọnọdụ Naịjirịa si emetụta ha nakwa ihe ha na-atụ anya ka e mee. Kirie ihe ha kwuru n'uju: https://www.bbc.com/igbo/afirika-54364104 +politics Aisha Buhari abatala n'ike na ebube "Ka gọmenti etiti gbaghachara kepukepu sị na Onyeisiala Buhari chọrọ ịlụ nwaanyị ọzọ, Aisha Buharị abatala n'ike na ebube na njem ọmere na mba UK kemgbe ọnwa abụọ. Eh, anyị nụkwara na ọṅụ juputara ndị enyi na ikwu na Ibe bụ ndị kweere ya egwu mama anata oyoyo. Aisha hapụrụ Naịjirịa n'ọnwa Ọgụstụ gawa haji na mba Saụdi Arabịa bụ ebe o si soro dị ya gawa London bụ ebe ọ nọ rụọ ụnyahụ. Akụkọ na-ekwu na ọ bụ ezumike dọkịnta ya nyere ya mere o ji gawa ya bụ njem. Ndị zutere ya ka ọ batara na Nnamdi Azikiwe Internationmal Airport bụ nwụnye ndị isiala mbụ na nwụnye ndị gọvanọ ndị ka na-achi ugbua. Okwuru na ụgbụa ya batara na ahụike, na ya adịla njikere maka ọrụ inyere ụmụaka na ụnwanyị ndị ogbenye aka. Ụmụnwaanyị ekwesighị iyi akpa ara pụta n'ụzọ taa. Taa bụ No Bra day na olu Bekee bụ ụbọchị emepụtara iji tinye uche ụmụnwaanyị maka igbochi ọrịa Cancer. Ma gị buru n'uche na BRA ahụ pụtara Breast Reconstruction Awareness Day. Ọ bụghị nke akpaara. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a. Gini ka ụbọchị 'No Bra Day' pụtara? Egbuola onyeisiojii ọzọ na Texas N'ofesi, ndị uweojii agbagbuola Atatiana Jefferson na Texas. Ndị uweojii akpọrọ ka ha bịa mata mkpọtụ na-eme n'���zọ be ha sị na ha chere na nwaagbọghọ ahụ dị afọ iri abụọ na asatọ chọrọ ịgba ha egbe. Onye agbata obi nwa ahụ egburu sị na ya nụru mkpọtụ na-eme na ụzọ nwaagbọghọ ahụ nke mere o ji kpọọ ndị uweojii. Ndị uweojii sị na mgbe ha na-agagharị na-enyo anya na ugegbe mpio mkpuru ebe nwa ahụ nọ, na ha hụru onye na abịa nso nọ n'ime ụlọ ahụ were chere na ọnye ahụ bịa ịwakpo ha were gbakanyere ya egbe. Mana ọkaikpe nwaagbọghọ ahụ na-ekwu na ọ na agba okwe na TV n'ime mkpuru ha mgbe ọ nụrụ mkpọtụ ndị ụweojii ahụ gazịa nyoo ka ọ mata ndị nọ ebe ahụ. Naịjirịa na Brazil apịala nku N'egwurewgwu, Naịjiria na Brazil agbaala onwe ha otu ọkpụ otu ọkpụ n'asọmmpi enye na enyi ha gbara taa na Singapore. Joe Aribo nyere ndị Naịjirịa goolu ha na nkeji 35"" ebe Casemiro saara Brazil ya bụ goolu na nkeji 48"", ka alatachara ezumike. Chi Super Eagles zọọrọ ha ka odogwu Real Madrid a bụ Casemero chọrọ itinye goolu nke abụọ ya na goolu mana ya bụ anụ gbanahuru ya ma okwoghị ya nke bụ ọdụ. Ọkpa nkọ Brazil ji eje mba so sọọ ya bụ mpi bụ mmadụ dịka Philipe Coutinho, Gabriel Jesus, Roberto Firmino nakwa ochie dika dịka Dani Alves. Mana ndị a niile achịtaghị aja n'ihu Super Eagles maka na ha ji nku ha pịanye ha ajụ n'anya. Cheta na Brazil ji ọkpụ atọ asataghị otu pịajie Super Eagles nku mgbe ha gbara bọolụ nke ikpeazu na National Stadium, Abuja. Asọmmpi enyi na enya a agbara ka onye nkuzi Super Eagles bụ Gernot Rohr sị na ọ bụ ya ka ya ji akwado maka asọmmpi iko mba Afịka na-abịanụ. N'ụlọ ọrụ nnọchite anya mba Brazil dị na Legọs, ndị nkwado Super Eagles buru egwu na ịgba ga ikiri ya bụ bọolụ ebe ahụ. Ndị ọrụ BBC sochiri ha azụazụ ebe ahụ ịwetere unu ka o sị gaa. Gee akụkọ ndị a niile n'otu nkeji" https://www.bbc.com/igbo/afirika-50035291 +politics Electoral Amendment Bill: Nkọwa ihe mere Onyeisiala Buhari ji ghara ibinye ya aka N’ọdinso a, ndị omeiwu Naịjirịa kwuru na ha ahazichaala iwu ga-achịkọta ntuliaka na Naịjirịa, nke bekee kpọrọ ‘Electoral Amendment Bill’, ma wegara ya Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o binye ya aka. Mana onyeisiala jụrụ ajụ, n’ihi na ọ chọrọ ka e wepụ ngalaba iwu ahụ nke kwuru na ọ bụ naanị usoro a kpọrọ ‘Direct Primaries’ ka a ga-esi na-eme ntuliaka imeụlọ na Naịjirịa. Onyeisiala Buhari kọwara ọghọm niile nwere ike isi na ‘direct primary’ pụta, nke mere o ji dị mkpa ka e nwee usoro ndị ọzọ pati dị icheiche nwere ike ịgbaso na ntuliaka imeụlọ, ma ọ bụrụ na ha chọọ. Dịka Buhari si kọwaa, ‘direct primary’ na-eri nnukwu ego, ọ na-egbu nnukwu oge, ọ na-akwalite wuruwuru na ntuliaka, n’ihi etu ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa si dị ugbua, ọ gaghị adị mfe ime ntuliaka na ‘ward' niile dị na Naịjirịa, nke ọnụọgụgụ ya dị puku asatọ, na narị asatọ na itoolu. E nwere usoro atọ e si ahọpụta ndị chọrọ iso zọọ ọchịchị: bekee kpọrọ ha direct primary; indirect primary; na consensus. ‘Direct Primary’ na-enye ohere ka onye ọbụla so n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị sonye na ntuliaka imeụlọ iji họpụta ndị ga-aga nnọchite anya pati ahụ na ntuliaka nke zuzugbe. Iji maa atụ, Anambra steeti nwere ‘ward’ narị atọ na iri abụọ na isii (326), nke a pụtara na pati ọbụla ga-emerịrị ntuliaka imeụlọ ha na ward niile ndị a n’otu n’otu. Ọ pụtakwara na Independent National Electoral Commission (Inec) ga-eziga ndịọrụ ha n’ebe niile ahụ ilekọta etu ntuliaka si aga, ndị uweojii ga-ezigakwa ndị ọrụ n’ebe ahụ niile iji gbochie nsogbu... Ụfọdụ na-ekwu na nke a ga-eri ego ma gbukwaa oge. N’aka nke ọzọ, ‘indirect primary’ pụtara na a ga-ahọpụta ndị pati olemole na ‘ward’ dị icheiche ka ha gaa nọchite anya ‘ward’ ha na ntuliaka imeụlọ nke pati ahụ. Inec ga-eziga ndị ọrụ abụọ maọbụ atọ ka ha gaa lee etu ya bụ ntuliaka si gaa, ndị uweojii ga-ezigakwa ụfọdụ ndịọrụ ha maka nchekwa... Nke a anaghị eri nnukwu ego maọbụ oge. Ụfọdụ na-ekwu na ‘indirect primary’ na-enye ike inye ohere ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị were ego gobie mmadụ olemole ahụ ahọpụtara ka ha bịa nọchite anya ‘ward’ ha na ya bụ ntuliaka. Usoro nke ‘consensus’ bụ mgbe mmadụ niile nọ na otu ndọrọndọrọ ọchịchị kwekọrịtara ma họpụta otu onye ga-anọchite anya ha, n’enweghị ntuliaka ọbụla, maka na ndị Igbo na-ekwu na a gbakọọ aka kwanye nwa nwa n’olulu, ọ naghị awa n’afa. Nke bụ eziokwu bụ na o nweghị ebe e si gawa Ọnịcha ka ọ dị nso, maka na atụsịwa ajị dị n’ajị, onye kere ajị agbara ọtọ. Ihe ka mkpa bụ ka ndị mmadụ tinye uche ma tinyekwa uchu n’usoro e si ahọp��ta ndị ga-achị ha. Ọzọkwa bụ ka e nwee ntaramahụhụ siri ike maka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eji ego egobi ndị mmadụ n’oge ntuliaka. Ka ọ dị ugbua, ndị omeiwu emegharịala iwu ntuliaka ọhụrụ a, ma tinyechaa ihe niile onyeisiala dụrụ ha ọdụ ka ha tinye. Ihe fọdụziri bụ ma Onyeisiala Buhari ọ ga-ebinyezi ya aka. O nwebeghị onye ma. https://www.bbc.com/igbo/afirika-60179961 +entertainment Basket Mouth: Ego bụ 'egwu e ji' n'ụwa anyi nọ Kedụ ihe ị chọrọ ịjụ Basket Mouth I nwebeghị ohere ịjụ ya? Ihe bụ ohere ị ga-eji nụ ka ọ na- asa ha. Kirie ihe nkiri a ka ị mata. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48706967 +business Ọgbambọ: Lee nwafọ Igbo ji aka ya arụpụta igwe njuoyi "Obinna Nwakanma gara mahadum ma bụrụ onye na-arụrụ onwe ya ọrụ ugbua site n'iji akpakara na ntụ oyi mebiri emebi arụ igwe eji eme ""ice block"". Lee akukọ a n'uju." https://www.bbc.com/igbo/afirika-55046335 +politics 'Anyị ga-achọta nnwereonwe ndị Yoruba site n'ụzọ udo ebe enweghi onye ga-anwụ na ya bụ atụmatụ' - Sunday Igboho Onye ndu otu Yoruba Nation ezipụtala ozi site n'aka ọkaiwu ya banyere https://www.bbc.com/igbo/afirika-60703632 +health Rotavirus Vaccine: Ihe mere o ji dị mkpa inye ụmụaka ọgwụ mgbochi maka ọrịa a Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ha etinyela ọgwụ mgbochi a kpọrọ 'Rotavirus Vaccine' ka ọ bụrụ iwu na ụmụaka niile a mụrụ ọhụrụ na Naịjirịa ga-agbarịrị ya. Mịnịstrị ahụike kwuru nke a n'Abuja n'ụbọchị Mọnde ma kọwaa na ya bụ ọgwụ mgbochi ga-abụ n'efu n'ihi na gọọmentị nakwa otu na-akwalite ọgwụ mgbochi n'ụwa niile bụ GAVI akwụọla ụgwọ ya. Ọnụọgụgụ gosiri na ụmụaka ọnụọgụgụ ha ruru puku iri ise (50,000) na-anwụ kwa afọ na Naịjirịa n'ihi nje 'rotavirus' Rotavirus bụ ọrịa nje na-efe efe nke na-akpata afọ ọsịsa na mmadụ ịnyụ nsị mmiri mmiri nke bekee na-akpọ 'diarrhea'. Nje a na-emetụta ma ụmụaka ma okenye, mana ọ na-aka njọ n'ahụ ụmụaka na-erubeghị afọ ise. Ọrịa 'rotavirus' na-amalite ma ọ gachaa ihe dịka abalị abụọ mmadụ butere ya bụ nje. Etu nje a si efesa bụ site na mmadụ imetụ onye butere ya bụ nje ahụ, maọbụ ịmetụ aka n'ebe maọbụ n'ihe onye bu nje a metụrụ aka bịakwa metụ aka ahụ n'ọnụ maọbụ n'ime ya. A na-ahụkarị nje 'rotavirus' n'ahụ ụmụaka dị afọ atọ ruo afọ ise. Ndị karala nka, nakwa ndị na-elekọta ụmụaka nwekwara nnukwu ohere ibute nje a. Nje 'rotavirus' na-efesakarị n'oge udummiri. N'ahụ ụmụaka, njirimara nje 'rotavirus' gụnyere: Mgbe ọbụla ị hụrụ ụdị ihe a n'ahụ nwatakịrị, were ọsọ kpọga ya ụlọọgwụ. N'ahụ ndị okenye, njirimara ọrịa 'rotavirus' gụnyere: Dịka ngalaba 'World Health Organisation' si kwuo ụzọ kacha mma iji gbochie ibute nje 'rotavirus' bụ ọgwụ mgbochi. Etu e si enye ọgwụ mgbochi 'rotavirus' bụ ịtụnye ya n'ọnụ. Ugboro abụọ maọbụ atọ ka e kwesịrị inye nwata ọgwụ mgbochi 'rotavirus'; nke mbụ bụ tupu nwata eruo izuụka iri na ise, nke ikpeazụ bụ ma nwata ruo ọnwa asatọ. Chetakwa na oge ụfọdụ, ọgwụ mgbochi 'rotavirus' nwereike ịkpatara nwatakịrị ka o nwee ụdị ihe ngosipụta ya bụ ọrịa. Nke a anaghị eme oge niile, mana ọ bụrụ na ị chọpụta na nwa natara ọgwụ mgbochi 'rotavirus' malitere nyụwa nsị mmiri mmiri maọbụ gbọwa agbọ, biko kpọgara ya dọkịnta n'oge. Ụzọ ọzọ ị ga-esi chekwaa onwe gị ma gbochie 'rotavirus' bụ ịkwọcha aka gị oge niile ma ị gachaa mposi, ma i hichaa nsị nwatakịrị, nakwa ma i hichaa agbọ nwatakịrị gbọrọ. Gbaa mbọ na-eji mmiri na ncha na-ehicha okirikiri ebe nwa gị na-anọkarị iji gbuo nje ọbụla dị ebe ahụ. Sachaa ihe ọbụla ị chọrọ iri nke ọma tupu i rie ya; n'ihi na nje 'rotavirus' na-esikwa na nri adịghị ọcha efesa. https://www.bbc.com/igbo/articles/cyjm3j2zxl1o +sports Arsenal vs Aston Villa: Arsenal azaala 'nna m agụ' taa "Aston Villa bịara n'ụlọ ndị Arsenal kpaa ha aka n'ọdụ mana Arsenal gosiri ha ihe o ji bụrụ nna m agụ. Arsenal si n'azụ were ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie ndị Aston Villa n'asọmpi nke taa. N'isi ụtụ ihe dịka nkeji 20 ka ndị Aston Villa gbara aka ahịa ma nye Arsenal goolu nke si n'aka J. McGinn. Dịka ọgụ a na-aga n'ihu onye bụ A. Maitland-Niles kotere ụka mere ogbu bọọlụ ji chụpụ ya na nkeji 41. Arsenal nwetere ohere penariti nke N.Pepe nyere ha goolu na nkeji 59. Mana Aston Villa zaghachịrị mgbe Wesley nyere goolu nke abụọ ha na nkeji 60. Nke a gbawara Arsenal obi mere ha ji were iwe nye goolu abụọ na nkeji 81 na 84 site n'aka Calum Chambers na Pierre-Emerick Aubameyang. Mmerie a mere ka Arsenal bụrụ ndị anọ n'ogogo tebụlụ Premier League. Man City azọọla Watford aja O dị otu Watford ka nrọ taa dịka otu Manchester City ziri ha egwu mmọnwụ. City kụnyere ha isi agba okpu mgbe ha nyere goolu asatọ asataghị otu n'asọmpị ha taa. Ihe ịtụ anya ndị mmadụ na-ekwu maka ya bụ na goolu ise n'ime ha bụ n'ime nkeji 18 ka enyere ha niile. Etu e si nye goolu ndị a bụ Bernado Silva na nkeji 1, Sergio Arguero na nkeji 7, Riyad Mahrez na nkeji 12, Bernado Silva na nkeji 15 nakwa Nicolas Otamendi na nkeji 18. Goolu ise ahụ bu etu e si mechi agba nke mbụ. N'agba nke abụọ, otu Watford kuliri n'ụra gbalịa ịnye goolu mana ọ mịtaghị mkpụrụ. Kama ihe mere bụ na Bernado Silva gbawara ụzọ goolu ọzọ na nkeji 48 nakwa na nkeji 60. Kevin De Bruyne dọkaziri neeti ndị Watford kpam kpam na nkeji 85 mgbe o nyere goolu nke ya. Onye ma ka obi ga-adị onye nche bọọlụ otu Watford ugbua? Taa ka ụlọikpe ga-ekwu hoo haa onye meriri ntụliaka ọkwa Gọvanọ emere n'Imo n'ọnwa maachị. Dịka ọ dị ugbua ha na-emezi nchịkọta ikpe ahụ nke Uche Nwosu, Ifeanyi Ararume na Hope Uzodinma gbara Emeka Ihedioha na-ekwu na mmeri ya ezighi ezi. Allen Onyema onye nwe ụlọọrụ AirPeace ekwuola na ha ga-aga ọzọ na mba Sawụt Afrịka bulata ụmu Naịjirịa ndị ọzọ ka chọrọ ịnata. O rụtụkwara ndị uweojii nke mba Saụt Afrịka aka kwuo na ha na-ada agbachi nkịtị ma a na-emebisi ihe ụmụ Naịjirịa n'ihi Xenophobia. Gọọmentị mba Kongo akwadola iwepụta ọgwụ mgbochi ọrịa Ebola nke abụọ iji belata ofufe ọrịa ahụ. Orịa Ebola egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri n'otu site n'afọ 2014 rue afọ 2016. Gọọmentị etiti agbaala Omoyele Sowore akwụkwọ n'ụlọikpe na-ebo ya ebubo ibupu ego na nzuzo nakwa ịchọ ịkwatụ ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari. Ha kwukwara na Sowore kparịrị Buhari na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ mere mgbe gara aga. Sowore bụ onye nwe ụlọọrụ ntaakụkọ 'Sahara Reporters'. O sokwa zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ a n'otu Lee ihe ụfọdụ ndị mmadụ kwuru: @Omojuwa kwuru na nwuchi Sowore bụ ihe ihere nye gọọmentị etiti. Oti egwu a ma ama bụ Adekunle Gold gosikwara iwe ya. @OgbeniDipo bụ onye ọka nkụzi kwuru na onweghi ihe ọjọọ ọbụla Sowore mere ma gwa gọọmentị etiti ka ha tọhapụ ya. @markessien kwuru na ọbụ sọ okwu ka Sowore kwuru. Ndị ọrụ uweojii nzuzo Naịjirịa a kpọrọ 'Department of State Services' (DSS) nwụchiri Sowore n'abalị abụọ nke ọnwa Ọgọst. Ihe e ji nwụchie ya bụ maka ịhazi ngagharịiwe nke ọ kpọrọ 'Revolution Now'. Sowore kwuru na ngagharịiwe ahụ bụ maka ọchịchị ọjọọ nke si n'aka gọọmentị etiti. Cheta na ụlọikpe enyebuola ikike ka ndị DSS jide Sowore ruo abali iri anọ na ise. Mana ka ọgachara abalị iri ise Sowore nọrọ na mkpọrọ, gọọmentị etiti agbaala ya akwụkwọ. Gọọmentị boro ya ebubo na o ji ụzọ aghụghọ zipu ego dị dọla 74,400. Ha kwuru na o zipuru $19,975 n'ọnwa Eprel, zipu $20,475, n'ọnwa May, zipu $16,975 n'ọnwa Jun, ma zipukwa $16,975 ọzọ n'ọnwa Julaị 2019. Ọzọkwa, gọọmentị kwuru na Sowore chọrọ iji ngagharịiwe 'Revolution Now' wee chutuo onyeisiala Muhammadu Buhari n'ọchịchị Mmechi 'border' na-amịta mkpụrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na mmechi emechiri oke ala Naịjiria na mba ndị ọzọ gbara ya okirikiri na-amịta mkpụrụ. O kwuru nke a mgbe ụfọdụ ndị ma ihe ekwe n'akụ maka azụmahịa bịara leta ya n'Abuja ụnyahụ. Ndị ahụ gụnyere otu 'Nigerian Association for Chamber of Commerce, Industry, Mines and Agriculture (NACCIMA) na ndị otu 'Federation of West African Chambers of Commerce and Industry (FEWACCI)'. Buharị kọwara na oteela aka Naịjiria jị arịọ arịrịọ ka mba ndị gbara ya okirikiri gbochilata mbubata ahịa adigboroja nakwa ntụbata ngwaahịa n'ụzọ ezighi ezi. Mana mmechi 'border' bụ iji wee gbaa ụzọ owere mgba ka o wee chie. Onyeisi ụlọ omeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila agbarụọla ihu etu ndi isi ọrụ nchekwa ụfọdụ siri gbajọọ ọgbakọ ọ kpọrọ iji chọọ ụzọ a ga-esi wulite nchekwa na Naịjiria. Gbajabiamila kwuru na ọ gbara ya gharịị etu ndị isi agha, nke ndị agha ụgbọelu na nke ndị ụgbọmmiri si hapụ ịbịa ọgbakọ ahụ kama zite ndị nnọchịanya. N'okwu ya: ""Nke a gosiri na onweghị ihe ha ji ụlọomeiwu a kpọrọ."" ""A ga m akọrọ onyeisiala Muhammadu Buhari ihe a ka ọ mara etu a ga-esi lebaa ya anya."" Gbajabiamila rịọrọ onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu nakwa onyeisi ngalaba na-ahụ maka mbata ndị mmadụ na Naịjirịa bụ Muhammad Babandende mgbaghara. Ọ chụghachiri ndị bịara ịnọchite anya ndịisi ndị agha, ma yigharịa ọgbakọ ahụ ka ọ dịzie ụbọchị Monde, abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Sepụtemba. Mba Amerịka ekpebiela na ha ga-eziga ndị agha ha na mba Saụdi Arebia dịka a tụrụ ogbunigwe abụọ na ụlọọrụ na-amịpụta mmanụ agbidi na mba ahụ. Dịka onyeisi ọrụ nchekwa Amerịka bụ Mark Esper si kwuo, ọrụ ndị agha ahụ ga-abụ ịga gbochi ọgbatauhie. Mana ka ọ dị ugbua, amabeghi ndị agha mmadụ ole a ga-eziga njem ahụ. Amerịka na Saụdi Arebia na-ebo mba Iran ebubo maka ịtụ ogbunigwe abụọ ahụ, mana otu ndị oyi egwu a kpọrọ Houthi rebels sị na ọ bụ ha tụrụ ya. Onye nkuzi a ma ama bụ Jose Mourinho agwala ndị mmadụ ka ha ghara ịkpọ ya aha gbasara ịnaghara Zinedine Zidan ọrụ na Real Madrid. Mourinho gwara ụlọọrụ ntaakụkọ dị na Spen a kpọrọ Deportes Cuatro na Zidan abụghị onye a ga-eleda anya ma abịa na nkuzi bọọlụ. O kwuru na agbanyeghi otu ihe si kwuru na ihe ajọghị njọ n'otu bọọlụ Real Madrid ugbua dịka ndị mmadụ si eche. Ọ kọwakwara na ihe ka ya mkpa ugbua bụ ịmụta asụsụ Jamini maka adịghị ama ama o nweta ọrụ na mba ahụ n'ọdinhu. Asụsụ Jamani ga-abụ asụsụ nke isii Mourinho ma asụ. Gee nkeji ebe a: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/media-49779820 +business Ada Palm Palm oil: Adapalm, ogige ọrụ ubi nwere osisi nkwụ karịrị 640,000 AdaPalm bụ aha ịchafụ nke ezigbo aha ya bụ 'Agricultural Development Authority Palm'. Ọ bụ ogige buru nnukwu ibu ebe a na-emepụta mmanụ nri. Osisi nkwụ a kụrụ n'ogige a karịrị puku narị isii na iri anọ na ụma. Ọ bụrụ na ogige a na-arụ ọrụ etu o kwesịrị, ndịọrụ ya ga-eru ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ. Mana kedu etu ọnọdụ AdaPalm dị ugbua? Lee ihe BBC Igbo chọpụtara oge anyị gara ebe ahụ. Ndị mere akụkọ a bụ Ikechukwu Kalu, Nnamdi Agbanelo na Adline Okere. https://www.bbc.com/igbo/afirika-58405964 +politics Simon Ekpa: Agaghị atụrụ m etu m ga-esi gbasaa ozi na Radio Biafra "Simon Ekpa, bụ onye Nnamdi Kanu nyere ikike ka ọ malite mewe mgbasaozi na Radio Biafra ekwuola na ya agaghị arụ ọrụ ahụ n'ọnọdụ ọ bụ ga-apụta dịka a na-atụrụ ya ihe ọ ga-eme. Maazị Ekpa, kwuru okwu na ọba Facebook ya ụnyaahụ kwuru na ya nabatara atụmatụ Nnamdi Kanu ahụ n'obi ọcha. Mana, dịka o siri kwuo, ụfọdụ mmadụ na-ewezi na n'ụzọ ọzọ. Ekpa kwukwara na ndị mmadụ ghara itinye aha ha n'ịchụnta ego ọbụla ma ya bụrụ na ha ebughi ụzọ nata ikike n'aka ya. Mana n' ọsịsa Ekpa nyere BBC n'ozi anyị zigara ya n'ọba ozi 'email', o kwuru na ""esemokwu dịrị anyị bụ okwu ezịnaụlọ Ipob , na ọ gbasaghị ndị iro"". Ǹke a na-abịa dịka otu Indigenous People of Biafra (Ipob), n'aka ọnụ na-ekwuru na otu Ipob agbajọọla nhọpụta ha kwuburu onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu họpụtara Mazi Simon Ekpa dịka onyeisi ụlọọrụ mgbasaozi ha bụ Radio Biafra. N'ozi ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Emma Powerful binyere aka ma wepụta ụbọchị Wednezde, Ipob kwuru na ihe kpatara nke a bụ Ekpa anaghị eso ntuziaka etu esi arụ yabụ ọrụ. Ọ sịrị, ""Onye ndu anyị bụ Nnamdi Kanu nyere ntuziaka ka ọ nọ na mkpọrọ mana Mazị Simon Ekpa jụrụ iso iwu.""O kwuru na ""Simon Ekpa jụrụ ibinye aka n'akwụkwọ iwu ji mgbasaozi na Radio Biafra.""Ọ gara n'ihu kwuo na ""Ipob bụ nnukwu otu agaghị agbanwe iwu ya maka ihi onye ọbụla."" ""Simon Ekpa bụ nwaafọ Biafra na-agba ezi mbọ maka nnwereonwe Biafra, mana o nwere ike ọ gaghị aga n'ihu n'ịgbasa ozi na Radio Biafra.""Ipob gara n'ihu kwuo na Maazi Simon Ekpa ka nwere ikike ịgbasaozi n'akara Facebook ya mana ọ gaghị abụsị onye mgbasaozi Ipob. O tebeghị aka Ipob pụtara kwuo na ha nyere Ekpa ikike ikwu okwu na Biafra. Nke ahụ mere ka gọọmenti Naijirịa pụtara kwuo na ha nwụchiri onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu n'ọnwa June ma kpupu ya ụlọikpe ebe ebugharịrị ikpe ya ruo ọnwa Julaị 26, 2021. Akụkọ ka na-abịa Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" https://www.bbc.com/igbo/afirika-57909591 +health Coronavirus in Nigeria: Kedụ ndị ọ bụ ọrụ ha igbochi Coronavirus ịbata na Naịjirịa? "Dịka ministri na-ahụ maka ahụike kwuputarala na ọrịa Coronavirus abatala Naịjrịa, ndị ọnụ na-erụ n'okwu akọwaala na ọ bụ ọrụ gọọmenti etiti ịhụ na ya bụ ọrịa abataghị na Naịjirịa. Jimi Disu bụ onye ntaakụkọ ọnụ na-eru n'okwu, kwuru na ministri na-ahụ maka ahụike kwesịrị ịnọ n'isi ya bụ mgbochi ọrịa. Ọ kpọkwara aha ministri na-ahụ maka ọpụpụ na mbata a kpọrọ immigration na Bekee, nakwa Ministri na-ahụ maka njem ụgbọelụ bụ Aviation na Bekee dịka ndị ọzọ kwesịrị iso na ya bụ ọrụ. Ọ sị na ọrụ ministri bụ ịhụ na e nyochara mmadụ niile na-abata n'ala a. Disu sị na ya bụ ọrụ abụghị ọrụ otu onye maka na a tụrụ anya na gọ��mentị etiti kwesịrị ihibe kọmitii ga-ejikọta ndị niile ga-arụ ya bụ ọrụ. Otu a ka ha ga-esi hibekwa kọmitii ndị a na steeti niile bụ nke ha ga na-elekọta. Disu kwukwara na ""gọọmentị kwesịrị ịkpọrọ ọrụ mgbasaozi maka igbochi ọrịa mkpa, iji hụ na esi ụzọ dị iche iche zisaa ya bụ ozi"". Ka esi egbochi ọrịa Coronavirus Ndị na-ahụ maka ahụike na-ekwu ka ndị mmadụ mee ihe ndị a iji gbochie ya bụ ọrịa ruo mgbe a chọtara ọgwụgwọ ya. Onwere ọgwụ mgbochi? O nwebeghị ọgwụ e ji agwọ maọbụ gbochie ọrịa a ka ọ dị ugbua, dịka otu mbaụwa ahụike bụ World Health Organisation si kwuo n'ọbaozi websaịt ha." https://www.bbc.com/igbo/afirika-51670114 +politics Ihe mere m ji akwado Yahaya Bello maka ọkwa Onyeisiala 2023 - Ralph Uwazurike "Ralph Uwazurike akọwaala ihe mere o ji akwado Gọvanọ Kogi State bụ Yahaya Bello maka ịbụ Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023. Cheta na Uwazurike na ndị otu ya mere ngagharị nkwado n'Owere n'izuụka gara aga, iji kpọọ oku ka ndị mmadụ nye Yahaya Bello nkwado. Uwazurike kwuru na ọ bụ ya na ndị otu 'Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra' mere ngagharị ahụ, mana ndị MASSOB agọlahụla Uwazurike. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Ralph Uwazurike kwuru na ọ bụ ""onye rịọrọ m ọrụ ka m ga-arụrụ ọrụ"". ""O nwebeghị onye Igbo ọbụla bịara kọtara m na ọ na-apụta ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa."" ""Onwebeghị onye n'ime ha kpọrọ m n'ekwentị, maọbụ zite mmadụ ka ha bịa kọtara m."" ""Mana anọ m n'ụlọ m Yahaya Bello a kpọrọ ọtụtụ ndị mmadụ bịa be m na-arịọ m ka m kwado ya dịka ọ na-apụta ịzọ ọkwa onyeisiala."" Uwazurike kwuru na ọ bụghị ebe onyeisiala Naịjirịa si pụta dị mkpa, kama ihe ka mkpa bụ onye ga-arụta ya bụ ọrụ nke ọma. ""Ikwu na ọ ga-abụrịrị onye Igbo enweghị isi, ebe ọbụla o si, ihe anyị chọrọ bụ onye ga-achịta nke ọma."" ""Ọ dịkwa mkpa ka e nye onye ntorobịa dịka Yahaya Bello ọchịchị, maka na ọ bụ ndị okenye mebiri Naịjirịa etu ọ dị ugbua."" ""Yahaya Bello achịala Kogi steeti ugboro abụọ, ọ bụrụ na ọ naghị eme ọfụma, ndị be ha gaara ịchutu ya n'ọchịchị."" ""Ndị ntorobịa ma na ha nwere ọdịnihu na Naịjirịa, ya mere na e nye ha ọchịchị, ha ga-eme nke ọma."" Etoruola m ịbụ onye a na-akwanyere ugwu n'ala Igbo Ralph Uwazurike kwuru na ọ bụ ihe mwute na ndị Igbo anaghị akwanyere ya ugwu ruuru ya. O kwuru na ya emeerela ndị Igbo ọtụtụ ihe kwesịrị ka a na-akwanyere ya ugwu. ""Ndị niile pụtara ịzọ ọkwa onyeisiala onweghị onye tozuru oke karịa m,"" Uwazurike kwuru. ""Agaala m mkpọrọ ugboro ugboro maka ndị Igbo."" ""Ọ bụ m bu ụzọ kwulite okwu 'Igbo Presidency'."" ""Ọ bụ m bidoro otu Massob, ma bụrụkwa onyeisi ya ruo taa."" ""Ndị a na-ekwu na ha achụpụla m bụ ụmụaka na-arịọ ego nri."" Otu Massob wepụtara akwụkwọ ozi n'ụbọchị Mọnde, abalị abụọ nke ọnwa Mee ma katọọ etu Uwazurike si eji aha ha etinye n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị. ""Anyị achụpụla Uwazurike na Massob kamgbe afọ 2015 n'ihi mpụ .""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-61304581 +entertainment The First Temptation of Christ: Netflix o mere Jesus arụ? "#BoycottNetflix na-ewu na soshal midịa dịka ndị mmadụ na-egosi iwe ha maka ihe nkiri ọhụrụ ụlọọrụ ihe nkiri ahụ wepụtara a kpọrọ 'The First Temptation of Christ'. Ihe karịrị nde mmadụ na-ekiri 'Netfilix' binyere aka n'akwụkwọ iji kwụsị ụlọọrụ ahụ iwepụta ihe nkiri ahụ makana ọ na-akparị ndị otu ụka kraisti. Kedụ ihe dị n'ime ihe nkiri a?(Ihe mgbawa obi juru ya) Ihe nkiri a bụ ihe ọkpaọchị nke otu nọ na Brazil a kpọrọ Porta dos Fundos (azụ ụnọ) wepụtara. O ruru nkeji iri anọ na isii na-egosi ebe Joseph na nwunye ya Mary na-ezukọrịta na be ha. Ọ malitere ebe ụmụnwoke atọ nwere amamihe na-achọ ""Jesu"" site na kpakpando. Ka ha fuchara ụzọ, ha mechara rute n'ụlọ Mary na Joseph. Ha abụọ nọ na-akwado emume ncheta ọmụmụ ""Jesu"" nọ n'Ọzara kamgbe afọ 40. ""Jesus"" mechara bata njem ọ nọ n'ọzara kamgbe afọ iri anọ, ya na ọyị ya nwoke akpọrọ Orlando. Ihe nkiri a na-akọwa na ""Jesus"" na Orlando na-enwe mmekọrịta nwoke na nwoke mana ""Jesus"" gọrọ ụkwụ na aka ya sị na ya na Orlando bụ naanị ọyị na ọyị. Ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere nke butere echiche a. Mana n'ikpeazụ, Orlando gosipụtara onwe ya dịka ekwensu bịara ịnwa ""Jesu"" ọnwụnwa n'ọzara, ma na-achọ ka ọ dachapụ n'oku Chineke kpọrọ ya. Ka o si dị ugbua, Netflix azachịghabeghị mkpesa ndị mmadụ na-eme maka ihe nkiri a. @APOSTLESULEMAN rịọrọ ndị mmadụ ka ha kwụsị ikiri Netflix. @elnathan_john kwuru na ebe ndị ụka Kraisti na-akatọ ndị ọzọ na-akpọ ha ndị ekweghị , ha na-ekwu ka aghara ịkatọ nke a? @LawrenceOkoroTL kwuru na ya ga-agbajọ Netflix. @aspirin_n kwuru na ya bụ ihe nkiri akwanyeghị ụka Kraisti ugwu." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50807053 +business Akwete fabric: Etu ndị Akwete si malite ịkpa akwa Nwaanyị na-akpa Akwaete bụ Gladys Akuatta kọwaara BBC Igbo etu ịkpa akwa a si malite n'obodo ha. O kwuru na ọ bụ nwaanyị a kpọrọ Dada Nwakata malitere ịkpa akwa site n'ihe e gosiri ya n'ime nrọ. Na ọ pụtara n'ihe malite ịkpa akwa a nke nwaanyị ọbụla n'obodo Akwaete bịara mụta ịkpa ya n'oge ahụ. Gladys gara n'ihu kwuo na ha anaghị akụziri onye na abụghị onye Akwaete etu esi akpa akwa a n'ihi na ọ gaghị amụta ya. Na nke a bụ iwu e tinyere n'obodo Akwaete gbaa gburugburu. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48912739 +entertainment M gwa gị na mụ echebeghị echiche ịpụ na Naịjirịa, mara na m bụ onye ụgha – Aproko Doctor "Dọkịta Chinonso Egemba, bụ dibia ahụike eji 'Aproko Doctor' mara na soshal midia, ekwuola na ya chere echiche ịgbapụ Naịjirịa ọtụtụ oge. Aproko Doctor kwuru nke a na mkparịtaụka pụrụ iche nke BBC Igbo haziri gbasara etu ọtụtụ ndị ntorobịa si agbapụ Naịjirịa aga mba ofesi, nke ọtụtụ na-akpọ 'Japa'. O kwuru na oge ya gụchara akwụkwọ dịka dọkịta, ọ rụrụ n'ụlọgwụ nkuzi 'Imo State University Teaching Hospital' ihe karịrị ọnwa iri mana akwụghị ya ụgwọ ọbụla. Ọ gara n'ihu kwu na nne ya na-ere akara, ịkwụ ụgwọ ụlọ na-esiri ha ike, nakwa ọ na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ abụọ maọbụ atọ iji mara ma ego ọ ga-abịa. ""Eleela m ule iji gafee mba ofesi, mana oge m malitere iwepụta ihe onyonyo na soshal midia, bịa hụ na ọ na-aga obere obere, ekwuru m na m ga-enyekwu onwe m otu afọ ka m mara ma ihe ọ ga-aka mma,"" Aproko Dr kwuru. Dr Egemba kwuru na ihe mere ọtụtụ ndị ntorobịa ji agbapụ na Naịjirịa bụ maka na ha anaghị enweta ohere ime ihe ha ga-eji nyere ndụ ha aka. N'aka nke ya Linda Iheme, bụ dọkịta na-ahụ maka eze, kwuru na ya gafere mba Kanada n'ihi na ọ chọrọ ihe ka mma maka ndụ ya. Ugbua, Linda Iheme nwere ụlọọrụ nke na-enyere ndị mmadụ aka ịpụ Naịjirịa ga gụọ akwụkwọ na mba ofesi dị icheiche. ""Oge m gara Kanada ọhụrụ, ana m arụ ọrụ n'ebe a na-ere nri. Ọrụ m bụ ịsa efere na ihicha ala, mana ego a na-akwụ m ebe ahụ, karịrị ego a na-akwụ m dịka dọkịta eze na Naịjirịa,"" Dkt Iheme kwuru. Ọ kọwara na ọpụpụ ya pụrụ na Naịjirịa apụtaghị na ya ahụghị Naịjirịa n'anya, kama ọ bụ ka ndụ ya kawanye mma. ""Ugbua, enwere ọtụtụ ihe m na-eme na Naịjirịa iji nyere ndị mmadụ aka, dịka ịrụ ụlọ akwụkwọ nakwa ihe ndị ọzọ,"" Iheme kwuru. Dkt Egemba kwuru na ọpụpụ a ndị ntorobịa na-apụ na Naịjirịa, ọ kachasị ndị ọrụ ahụike, na-emetụta Naịjirịa nke ọjọọ. ""Naịjirịa so na mba ọnụọgụgụ ndị dọkịta ha kacha nta iji tunyere ọnụọgụgụ ndị mmadụ nọ na ya."" ""Mana ugbua, ndị dọkịta ahụ na-agbapụ agbapụ, nke a na-emetụta ọnọdụ ahụike n'ụzọ ọjọọ."" ""Otu enyi m kpọrọ m izuụka olemole gara aga, na-arịọ m ka m chọtara ya dọkịta ga-eleta nna ya na-arịa ahụ anya, maka na ụlọọgwụ ha gara enweghị dọkịta ọbụla nọ ebe ahụ."" N'okwu nke ya, Dkt Linda Iheme kwuru na ọ ga-adị mma ma gọọmentị Naịjirịa na mba ndị ọzọ nwee nkwekọrịta na ọtụtụ ndị na-abịa na mba ha ịgụ akwụkwọ ga-anọ afọ olemole ma laghachite Naịjirịa iji were mmụta ha nyere obodo aka. ""Iji maa atụ, mụ onwe m kpebiri na ọpụpụ m pụrụ na Naịjirịa ga-abụ ihe ọma, ọ bụ ya mere m ji eme ọtụtụ ihe m na-eme na Naịjirịa dịka inye ndị mmadụ onyinye ịgụ akwụkwọ n'efu."" Magbapụ ndị ọrụ makwa ndị ntorọbịa n'igwe abụrula ihe na-ewu ewu ọ kachasị na ndịda Naịjirịa. BBC Igbo ga-enwe mkparịtaụka maka uru na ọghọm dị na ya. Atụmatụ a ama dịka 'japa' bụ okwu mbite n'asụsụ Yoroba pụtara mgbapụ n'asụsụ Igbo. Ọ bụzị ihe ọtụtụ ndị ntorọbịa na-agbasi mbọ ike ihu etu ha ga-esi na Naịjirịa gbapụ gaa mba ofesi mepere emepe ina-ebiri ndụ ha. E lee ya anya nkịtị, atụmatụ a dị ka ihe ọma n'ihi akụkọ ọma nakwa foto mara mma ndị mere ya bụ njepụ na-egosiputa. Mana e nwere ọtụtụ ọghọm nakwa ọdachi so ya bụ atụmatụ a, nke ọtụtụ mmadụ akwadoghi onwe ha maka ya. Ọghọm ọzọ dịrịla Naịjirịa dịka mba maka ihe a na-akpọ 'brain-drain' bụrụ mgbe ndị ma ọrụ bụ ọkacha mma na mba ahụ na-akwapụ n'igwe. Nke a mere ka BBC Igbo hibe mkparịtaụka ndị ���nụ na-eru n'okwu nakwa ndị ihe a metụtara iji tulee ya bụ okwu ọfụma. Mkparịtaụka a ga-amalite n'elekere asaa nke mgbede Wenzde 28 Septemba 2022 na BBC News Igbo Facebook. Pịa aka ebe a, ka i gaa. Kwa ọnwa atọ, BBC Igbo na-eme ya bụ ọgbakọ ezumezu a ka ndị ọnụ na-eru n'okwu sonye kpata maka ya bụ okwu ndị metụtara ndị Igbo iji hụ etu ọ ga-esi dị mma. BBC Igbo emerela ọgbakọ ezumezu a ugboro isii. Lee ụfọdụ n'ime ha:" https://www.bbc.com/igbo/articles/cm5yg44y4emo +health World Cancer Day: 'Eji m ụkwụ bịa ụlọọgwụ mana ozugbo m nụrụ na m bu Kansa aganwuzịghị m ije' Abumchukwu Ezeilo bụ onye rịaburu ọrịa kansa ma merie kọrọ akụkọ ihe mere ụfọdụ ji anwụ n'ọrịa kansa bụ maka ha anaghị aga ezigbo ụlọọgwụ. Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, Ezeilo kọrọ akụkọ ka ya si gbalahụ kansa. https://www.bbc.com/igbo/48048375 +entertainment Valentine Messages: Lee di na nwunye birila ruo afọ 70 ka na-eme 'Love nwantịntị' "James na nwunye ya bụ Elisabeth Ani ebiela ka di na nwunye ruo afọ iri asaa ma nwee ezigbo ifunanya nye onwe ha. Ha bụ ndị Amankpu, Obinagu-Uwani, Akpugo, Enugu steeti. James kwuru na ọ bụ ebe ha na-egwu ọnwa ka ọ hụrụ nwunye ya Elisabeth. O kwuru na ọ bụ n'afọ 1951 ka ọ lụrụ nwunye ya mana ụmụ ha kwuru na ha alụọla tupu afọ ahụ. Elisabeth nwunye ya kwuru na ọ na ya na di ya na-ebi n'udo na-eweghị nsogbu ọbụla. Otu nwa ha nwoke bụ Sunday Ani kwuru na ha abụọ mụrụ ụmụ iri na abụọ mana mmadụ asaa n'ime ha nwụfuru. N'ọnụ Sunday, ""nne m na nna m alụọla ruo ihe karịrị afọ iri anọ na ụma tupu ha agba akwụkwọ n'ụlọụka n'Eprelu 2007."" ""Ọ bụ ezigbo agwa ha na-akpa mere ka ha nọrọ ruo ugbua dịka di na nwunye."" Ihe ndị ọzọ ha kwuru dị n'ime ihe nkiri a dị ebe a. Akụkọ a di mkpa dịka a na-eme emume Valentine, nwoke ụwa mara dịka onye gosiri ihunanya nke ukwu dịka akụkọ ifo si kwu. Mana Chika Okpalike bụ ụkọchukwu na ọkammụta n'African Traditional Religion gwara BBC okwu maka onye bụ Valentine a ụwa kpụ n'ọnụ ma na-ekwu na enwere ọtụtụ akụkọ so ya. O di mma ka ndị ntoroọbịa mara udiri ihunanya ha kwesiri ịṅyomi karịa ma nke nwerike ibutere ha ọghọm." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60278862 +sports Man United vs PSG: Ike 'ekwensu ọbara ọbara' dara, ike PSG eguzoro "Otu PSG tiri Man Utd mmọnwụ, iji gosi ha na ha abịaghị igwu egwu, ka ha ji goolu abụọ merie ha na Old Trafford. Nke a bụ mmeri mbụ a na-emeri otu egwu bọọlụ Man Utd kemgbe Ole Gunna Solskjaer malitere ịchịkọta ha. Presnel Kimpembe ji ha gbachara ọnụ ma gbaa aka ahịa, n'ihe bụ goolu mbụ ọ na-enyere ndị PSG. Kylian Mbappe dọkara neetị David De Gea n'ọkara nke abụọ, ebe e mechara chụpụ Paul Pogba ka o nwetara akwụkwọ edo edo abụọ. Angel Di Maria gbabuuru Man Utd bọọlụ eleghi anya n'azụ ka ọ na-agwọ ha ara n'agbanyeghi emu ha nọ na-akwa ya; o bunyere Kimpembe bọọlụ o ji nye goolu. Anthony Martial na Jesse Lingard merụrụ ahụ n'ọkara mbụ, mere ka ewepụ ha. Ajụjụ onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua bụ ""isi Man Utd a ga-apụtakwa mgbe ha ga-aga na Parc des Princes n'ụbọchị isii nke ọnwa Maachị?"" Ihe mberede okporoụzọ mere n'Imo steeti:Ụgbọala Tipa dakwasịrị ma kurie otu ụgbọala Pasat bụ nke otu pati APC ji achụ nta vootu n'Owere bụ isi obodo Imo steeti. Ihe mberede a mere n'okporoụzọ akpọrọ Jacob Zuma bụkwa nke e ji ""akanchawa"" wee mara.Anya hụrụ ka o si mee gwara BBC Igbo na ihe mberede a mere ka obere ụgbọala a e ji achụ nta vootu nke Muhammadu Buhari nakwa Rochas Okorocha, chọrọ igbafe ụgbọala Tipa ahụ.O kwuru na onweghi onye nwụrụ, mana e burula onye ọkwọụgbọala ahụ gawa n'ụlọọgwụ makana ọ merụrụ nnukwute ahụ. Nnamdi Kanu na BBC: Na mkparịtaụka Nnamdi Kanu na BBC Igbo nwere, o kwuru na ihe ọ gabigara n'aka ndị agha mere o ji zoo mgbe ahụ o zoro. O bokwara ndị na-achị mpaghara ọwụwa anyanwụ ebubo na ha chọrọ igbu ya n'afọ gara aga, so mee o ji gbaa ọsọ, gaa lekọta onwe ya n'ahụ ọ merụrụ. Gere ihe ndị ọzọ o kwuru ebe a: Udo ga-achị n'Imo steeti: Ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti ebinyela aka n'akwụkwọ udo, ebe ha kwenyere na udo ga-achị na ntuliaka na-abịa. Ndị otu ọrụ nchekwa niile nọ n'Imo steeti nke gụnyere ndị uweojii, haziri emume a. Ndị binyere aka n'akwụkwọ udo a gụnyere: Emeka Ihedioha nke PDP, Uche Nwosu nke AA, Linus Okorie nke YPP, Tony Nwulu nke UPP nakwa ụfọdụ ndị ọzọ. Ikedi Ohakim nke pati Accord, Hope Uzodimma nke APC nakwa Ifeanyi Araraume nke APGA bụ ndị osote ha nọchiri anya ha na mmemme ahụ. Kọmishọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Dasuki Galadanchi, n'ozi nnabata ya, gwara ndị na-azọ ọkwa ka ha cheta na ha enweghi steeti ọzọ karịa Imo, ma dụzie ha ọdụ ka ha jiri udo kpọrọ ihe. N'ofesi, Ụlọikpe dị na mba Amerịka achọtala ihe n'aka Joaquin Guzman bụ onye mba Mexico na-atụ mgbere ọgwụ ike a ma dị ka El Chapo. N'agbanyeghi na a mabeghi ya ikpe, a na-ekwu na e nwereike ịtụ ya nga mkpụrụọka ga-eme ka ọ nọgide n'ụlọmkpọrọ ruo oge ọnwụ ya. Gee nkeji BBC Igbo ebe a: Lee ihe nkiri taa:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-47222779 +business Ụzọ ise ị nwereike iji agbalahụ ụbịam ugbua "Nke bụ eziokwu bụ na ma nwa e bu n'afọ na Naịjirịa ugbua amarala na ihe tara akpụ, kpọọ akpọ ka chịnchịn. Ma onye elu ma onye ala, ma onye ukwu ma onye nta na-ebe na obodo bụ igwe. I nwereike hie ụra teta ego naịra a na-ada, na-akpụ afọ n'ala, nke ka njọ bụ na ị gacha ahịa na mgbede labaa, tupu i teta n'ụtụtụ, ihe ahụ ị zụtara na mgbede etinyela ego karịa ihe ị tụrụ anya ya, nke a na-eme ka onye ọbụla na-ebe akwa arịrị. Mana ihe dikwa mkpa ịmata bụ na ụdị ihe isi ike a na-adị oge niile a chọrọ ime ntuliaka ọhụrụ na Naịjirịa. Nke mere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji eji nri eme achụmnta vootu n'oge gara aga maka na agụụ akarịala n'obodo. Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eji agụụ eme ngwaagha ha ji achụ nta vootu mana oge a, ọ dị ka a ga-asị na ihe agbanweela. Ebe ọ bụ na dịnta amụtala ịgba na-ataghị ata, nwannụnnụ ga-amụta ifegharị na-ebeghi ebe. Ọ dị mkpa ịmata ụzọ mmadụ ga-esi enyere ndụ ya aka n'oge a ka ọ ghara inwe ọbara mgbali elu ebe a na-eche echiche maka ihe isi ike. Ugbua abụghị oge e ji ata ego 'vamvamvam', nke onye nwere, o jidesie ya ike mara etu ọ ga-esi enwetakwu karịa imefu ya emefu. Ọ dị mkpa mmadụ ilebara etu o si emefu ego anya mara ebe ego ya na-ala na ihe ndị na-eri ya ego iji mara etu o ga-esi hazie onwe ya. Mee bọjetị ka i wee mara ihe dị mkpa na ihe ndị na-adịchaghị mkpa karịa. Etu ahụ, ị ga-ama ebe ego kwesiri ịga na ebe ndị i nwereike idi. 2. Kwusi mbimbi Igbo sị na ""ebe aka ruru nwaanyị ka ọ na-atụkwasị di ya."" Onye niile kwesiri ịgba onwe ya ume ma guzosie ike iji gbanarị ọnwụnwa ibi ego. Ihe na-eche mmadụ ugbua akarịala iji tinye ụgwọ n'elu ya. Jidesie onwe gị ike n'ihe ọbụla ị na-enweghi ego ya ka ị hapụ ya. Wepụ anya gị n'ihe ị na-enweghi ego ya ma gị emela maka na ndị ọzọ mere. Ejila maka Ịnstagram maọbụ soshal midịa tinye onwe gị n'agbagharịa. Ebila ego iji mee ihe na-agaghị amụtara gị nwa ego n'elu ya ka i nwee ike hie ụra nke ọma n'abalị. Onye ọbụla kowe akpa ya ebe aka ya ga-eru ya. 3. Mụta aka ọrụ ọzọ ma chọta ụzọ ọzọ iji enweta ego Ndị ọkacha mara n'okwu gbasara akụnaụba ekwuola ọtụtụ oge na isi n'otu ụzọ enweta ego anaghị aba mmadụ ọgaranya, i kwesiri inwe ụzọ dị icheiche ego si abata gị n'akpa, o si ebe a bata, si ebe ọzọ bata, akpa eju. E nwere ọtụtụ aka ọrụ dị icheiche mmadụ nwereike ime n'akụkụ iji nweta ego tinyere ego ụgwọ ọnwa maọbụ ego ọrụ ị na-anata. Tinye uchu mụta otu ga-enye aka n'oge ụkọ a. 4. Azụzịla ihe ọhụrụ ma i nwere ya nke ochie Ekeresimesi fọrọ izu ole na ole, oge e ji adọ ndị mmadụ gote gote. Biko lezie anya nke ọma n'ụlọ gị mara ihe ndị i nwere i nwereike iwepụta tichaa ya nke ọma maọbụ saa ya mmiri ka o wee ghọrọ nke ọhụrụ kama imefu ego zụta nke ọhụrụ. Ọ bụghị iwu na ị zụrụ akwa ọhụrụ, o nwere akwa ụfọdụ ndị ị zụrụ kamgbe ị na-emetubeghidị aka, gaa chịpụta ndị ahụ kama ịzụ nke ọhụrụ. O nwekwara ike na akpụkpọ ụkwụ juru n'ime be gị mana umengwụ ekweghị gị gaa kpopụta ha. I lemie anya elemi, ihe ndị dị n'ụlo nwereike ibetara gị ego dị egwu n'oge a. Ọzọkwa dị ka ibe ya bụ na ị hụ ebe ọ ga-ebelatara gị ego ma ihe ahụ dị ezigbo mma, biko agala ebe ọ ga-eri gị ego karịa. Chọọ ebe ọ ga-ebelatara gị ego oge niile mana azụkwala ebere ego ebere akpa. 5. Malite ịnata ndị enyi gị ego maka akaọrụ ahụ ị na-enye ha n'efu I nwere ihe ndị Bekee kpọrọ 'hobbies' bụ ihe ndị ị na-eme na-etinye uche na ya, ihe ndị ahụ nwereike ịkpatara gị ego. Ugbua bụ oge mmadụ kwesiri inweta ego n'ụzọ dị icheiche, kama ime ya n'efu, natawa ndị mmadụ ego maka ya ka o tinyekwuo na nke i ji. Nke ikpeazụ a bụzi mgbakwụnye, ""a zụla ihe ahụ karịa ma ọ dị mkpa karịa ihe ndị ọzọ niile""." https://www.bbc.com/igbo/articles/cpd19nvkem4o +politics Okpukperechi mmadụ o kwesịrị ibute okwu na ndọrọndọrọ ọchịchị? "Okwu gbasara okpukperechi na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa gbaliri elu ọzọ dịka Bola Tinubu, bụ onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na pati 'All progressives Congress' kpọpụtara Kashim Shettima dịka osote ya. Tinubu na Shettima bụ ndị okpukperechi Islam, nke mere ka ọtụtụ mmadụ na-akatọ APC. Naịjirịa bụ mba e ji okpukperechi dị icheiche mara, mana abụọ kacha ibe ha bụ okpukperechi Kraịst na nke Islam. Mana gịnị kpatara okwu okpukperechi ji bụrụ nnukwu ihe na ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa. Ọtụtụ mba ndị mepere emepe n'ụwa anaghị etinye uche n'okwu gbasara okpukperechi n'oge ndọrọndọrọ ọchịchị. Iji maa atụ, Sadiq Khan, onye na-achị London, bụ isi obodo mba England, bụ onye Islam, n'agbanyeghị na England bụ obodo e ji okpukperechi Kraịst mara. BBC kpọtụrụ Mazi Onwuasoanya FCC Jones, onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama nọ na pati APC. ""Mmepe Naịjirịa erubeghị ka nke London na mba ofesi ndị ọzọ,"" FCC Jones kwuru. ""Ọ dị mkpa ka ọchịchị ọbụla gosipụta nnabata okpukperechi dị icheiche."" ""Ịhọrọ mmadụ abụọ si n'otu okpukperechi dịka onyeisiala na osote ya, egosighị nnabata okpukperechi nke ọzọ."" ""Ọ pụtara na enweghị onye tozuru etozu n'okpukperechi Kraịst?"" Murtala Chukwuemeka, n'okwu nke ya, kọwara na okpukperechi dị mkpa n'ọchịchị obodo, ọ kachasị obodo dịka Naịjirịa. Chukwuemeka bụ onye nkuzi n'okpukperechi Islam. O kwuru sị: ""Okpukperechi na-eduzi ndị mmadụ n'usoro dị mma iji kpaa agwa n'ihe niile."" ""Mana ihe ka mkpa n'ọchịchị bụ ịhọpụta onye nwere mmụọ eziokwu na ịkwụba aka ọtọ, ma ọ bụ okpukperechi Kraịst ma ọ bụ nke Islam."" Otu ngụkọ e mere na 2018 gosiri na pasentị iri anọ na itoolu (49.3%) ndị bi na Naịjirịa bụ ndị okpukperechi Kraịst, ebe pasentị iri anọ na asatọ na ụma (48.8%) bụ ndị Islam. Pasentị abụọ na ụma ndị ọzọ bụ ndị kwenyere n'okpukperechi ndị ọzọ dịka ofufe ọdịnala, Judaism, na ndị ọzọ." https://www.bbc.com/igbo/articles/cljkl6wn1nko +business Ndị ohi ịntanetị mba Nọt Korịa zuru ego 'crypto' ruru nde $400 "Ndị uweojii Naijirịa anwụchiela mmadụ anọ ha na-ebo ebubo iri anụ mmadụ ma na ere kwa ya na Zamfara steeti. Kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Ayuba Elkanah gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ dimkpa abụọ na ụmụ ntakịrị nwoke abụọ ka ha jidere maka ihe a mere. Elkanah kwuru sị, ""Ọ bụ n'ụlọ arụchabeghị ka anyị hụrụ ozu a"". O kọwara na mgbe ha hụrụ ya bụ ozu na ụfọdụ akụku ahụ ya adịghị. O kwuru sị, "" Ọ bụ mgbe anyị na-achọ nwata nwoke gbara afọ itolu achọ ka ndị uweojii chọpụtara ozu ahụ"". Elkanah kwuru na onyeisi ndị omekome ahụ kwụrụ ha puku narị naịra ise dịka ụgwọ maka akụkụ ahụ ndị mmadụ. Zamfara bụ steeti mkpamkpa na-arị ibe ya elu nke gụnyere ogbugbu mmadụ na ịtọ mmadụ na-enye nsogbu ugbua. Ndị ohi ịntanetị mba Nọt Korịa zuru ego 'crypto' ruru nde $400 Ụlọọrụ Chainalysis e ji teknuzu 'Blockchain' mara kwuru na afọ 2020 na 2021 bụ afọ ndị na-ezu ohi na ịntanetị kacha zute ego. Ha kwuru sị,""Site n'afọ 2020 ruo 2021, ohi ezuru na ịntanetị nke aka ndị mba Nọt Korịa nọ ya sitere na paseenti anọ ruo paseenti asaa. nke a pụtara na ego ha zutere ji passenti iri anọ gbago"". Chinalysis kwuru na ụzọ ndị a si ezu ohi 'Crypto' bụ 'Phishing', 'Code' adịgboroja na 'Software' eji awakpo igwe kọmpụta mmadụ. Nọt Korịa na-ekwu na ụkwụ na aka ha adịghị n'ihe ọbụla gbasara ohi Intanetị. Mba Ọstralịa akagbuola akwụkwọ njem Novak Djokovic ọzọ Mba Ọstralịa akagbuola ọpịa Tenis bụ Novak Djokovic ịbata mba ha nke ugboro abụọ. Mịnịsta na-ahụ maka ndị njem na Ostralịa bụ Alex Hawke kwuru sị, "" Taa, ejị m ikikere m kagbuo akwụkwọ njem Mazị Novak Djokovic. nkagbuoa gbadoro ụkwụ n'ahụike na ọdịmma ndị mmadụ"". Djokovic onye kwesịrị iso n'asọmpị Australian Open ga-ebido n'ụbọchị Mọnde nwere ohere ịga ụlọikpe maka mkpebi a. Cheta na o kwuru na ọ ma na ọ dara iwu nchekwa ọrịa Covid-19 mba ahụ dịka ọgbabeghi ọgwụ mgbochi ya bụ ọrịa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59995166 +health Nwoke kwere ka agwọ 200 taa ya iji chọta ọgwụ agwọ maka mbaụwa "Kwa nkeji ise ọbụla, otu onye nọ otu ebe na-anwụ site n'arụ agwọ tara ya, ebe mmadụ anọ nwere ike ibute ọrụsị site n'arụ agwọ. Mana o nwere ụfọdụ ndị kara obi jiri agwọ eme nchọpụta. Tim Friede, onye bi na Wisconsin dị na mba Amerịka sere onwe ya ihe onyonyo ebe ọ kpachara anya hapụ ka agwọ ọjọọ taa ya ma tinyekwa ihe onyonyo ndị a na 'Youtube.' Ihe ụfụ ozigbo ozigbo N'otu ihe nkiri a, ka agwọ ọjọọ a kpọrọ mamba tachara ya, ọ gbara ọbara na-apụ ya n'aka nkịtị na-ekwunye okwu n'igwe na-ese ihe onyonyo. ""A bịa n'agwọ ojii mamba, ụfụ ya na-abịa ozugbo. Ọ na-adị ka otu puku aṅụ ịgba mmadụ. Aṅụ na-enwe onunu inu (venom) otu miligram maọbụ abụọ mana agwọ 'mamba' taa gị, o nwere onunu inu ruru narị miligram atọ maobu nari ise (300-500 milligrams.)"" Ọ gwara BBC ihe mezịrị: O kwuru sị, ""O bidoro zawa azawa ka nke a mechara. Ụbọchi ole na ole na-eso ya, o jituru m. Site n'ụdị ọziza ọ zara m nwere ike ikwunwụ onunu inu ole agwọ ahụ tanyere m n'ahụ. Ọ fụrụ m ezigbo ụfụ."" Mana ọ bụghị onye ọbụla ka ihe na-atụ n'anya dịka o si atụ ndị ihe ya na-amasị na YouTube. Dkta Stuart Ainsworth nke si n'ụlọakwụkwọ 'Liverpool School of Tropical Medicine' kwuru na ""Ihe ndị a na-eme edoghị anyị anya. O zighị ezi. Nnukwu egwu dịkwa na ya. Anyị na ha anaghị arụkọ."" Ụlọ mmụta ya so na ndị na-achọ ọgwụ agwọ ozuru mba ọnụ ọhụrụ. Ihe na-eme bụ na a na-ebu ụzọ tulee ọgwụ mgbochi ọhụrụ n'ahụ oke na ụmụ anụmanụ ndị ọzọ. Ọ bụ naanị oge o doro anya na ọ gaghị emerụ mmadụ ahụ ka a na-atụle ya n'ahụ mmadụ. Dkta Ainsworth sị,""Ndị mmadụ nwere ike inweta ọdaeshi agwọ site n'ime ka agwọ taa ha n'ihi na o nweghị iwu mabidoro ya. Mana ụdị ihe nwere ike ibute ọnwụ. Mmadụ ekwesịghị ime ya."" Mana n'ụlọrụ na-emepụta ọgwụ agwọ niile dị na mbaụwa, e nweghị ntụziaka etu o kwesịrị ka e si na-eme nchọpụta maka ọgwụ agwọ Dịka 'Wellcome Trust', otu mba Briten anya ha dị n'imepụta ọgwụ mgbochi ọhụrụ si kwuo, ""E nweghị usoro mmepụta, nchekwa maọbụ nhazi zuru ọnụ onye ọbụla na-agbaso."" Friede kwusiri ike na ọ bụghị eziokwu na ya n'etinye ndụ ya n'ọnụ ọnwụ iji nweta ndị na-eso ya na soshal midia. ""E meghị m ya iji mee ihe onyonyo YouTube - Achọrọ m ịzọ ndụ nakwa ime ihe pụrụ iche na ndụ ndị mmadụ. ""Eji m YouTube achọ ndị dọkịta mụ na ha ga-arụkọ. Ọ bụ ihe a maghị ma ọ ga-enwe isi. O nweela isi."" N'ime ụdị agwọ ruru 3,000, naani 200 nwere onunu inu kajara akaja nke nwere ike igbu mmadụ maọbụ kụọ ya ngwụrọ. Friede macha ha niile. Ọ masị ya bụrụ nke a kpọrọ 'cobra, 'viper' maọbụ 'mamba', o diela ụfụ arụ agwọ tara ya n'afọ iri abụọ. Nke a gbakwụnyere ugboro 700 ọ gbanyere onwe ya onunu inu agwọ n'ahụ. Oke onunu inu agwọ nwere ike ịtanye mmadụ na-adị icheiche. Ụfọdụ, agwọ nwere ike ịta gị na-agbanyeghị gị onunu inụ ọbụla n'ime. Friede sị, ""Ọ bụrụ na ahụ gị etichibeghị n'ebe agwọ dịka mamba nọ, o nwere ike ime ka ekoume (diaphragm) gị nke na ị gaghị ekuli ume. Anya gị agaghị ekwe mmepe, ị gaghị ekwuli okwu, ị ga na-agba ruo oge ahụ gị kpọnwụrụ mana uche gị ka ga na-arụ ọrụ ganye ma ị nwụọ."" Friede na-azụ ọtụtụ ajọ agwọ n'azụ ụlọ ya ma na-anwale ọtịta ha n'ahụ ya. ""E nwere m agwọ cobra mmiri m si Afrịka nweta. Arụ ya na-adị egwu. Ọ na-eyi egwu."" Friede nwere nkwenye na ị na-agba onwe gị onunu inu nwayọ nwayọ, ahụ gị ga-etichi ghọọ ọdaeshi n'ebe agwọ ọjọọ nọ mana a katọrọ usoro ọ na-agbaso. Inweta 'ọdaeshi' agwọ Ọ bụ ịgbaso ụzọ yiri ya nke e ji ụmụanụmanụ eme nyere aka ka e nweta ọgwụ agwọ nke a eji agwọ arụ agwọ ugbua. Mmepụta ọgwụ agwọ enwebeghị nnukwu mgbanwe kemgbe '19th Century'. A na-agbanye nsị agwọ ya bụ onunu inu agwọ n'ahụ anyịnya maọbụ atụrụ ma mịpụta mgbochi ọbara ha ga-amụpụta. Friede sị, ""Anyị nwere anụmanụ ndị chọrọ igbu m mana achọghị m ịnwụ. Ya mere aghọ m anyịnya. Kedụ ihe bụ na-anyị agaghị echekwa onwe anyị?"" Friede , onye gbara afọ iri ise abụghị ọkammụta maka nchekwa ahụ nke ọ na-aga mahadum. Ọ bụ egwu agwọ ọjọọ ịtagbu ya mere ya dabanye na ime ihe o bidoro ime kemgbe afọ 20 gara aga. O bidoro na ududo na akpị were si na ha fere n'agwọ ọjọọ. ""Ọ bụghị agwọ niile ka m nwalerela. Ana m ahọrọ ndị na-egbu ngwangwa."" O nwere ọtụtụ apa si na nwale o merela, oruela n'ọnụ ọnwụ ọtụtụ mgbe. Mana ọ na-enye ya aṅụrị na agwọ ịta ya, o nwetakwa onwe ya na ahụghị dọkta. ""Ihe dịka ugboro 12 , inwetakwa onwe m rịara ahụ. n'otu nwale m mere n'afọ mbụ, ebugara m ụlọọgwụ eebe m hiri ka agwọ 'cọbra abụọ tachara m."" ""Ị ga-amụta ihe. O nweghị dọkịta maọbụ mahadum n'ụwa a ga-akụziri gị nke a."" Onye ọrụ nchekwa ahụ(immunologist a kpọrọ Jacob Glanville hụrụ ihe Tim Friede na-eme n'ihe onyonyo dị na YouTube kpọtụụ ya. Ugbua, ụlọụ ya na Friede na-agba mbọ irụpụta ọgwụ agwọ pụrụ iche nke ha ji ihe si n'ihe ha mịtara n'ọbara Friede. ""Ihe Tim mere dị ịtụnanya mana ọ dịkwa egwu. Agaghị asị onye ọbụla ga-eme ụdị ihe a."" Dịka WHO siri kwuo,kwa afọ, agwọ na-ata mmadụ ruru nde ise na ụma anọ ( 5.4 million). Ndị na-anwụ na-eru bido na 81,000 rue 138,000. Ihe karịrị 400,000 bụ ndị na-esi narụ agwọ bute ọrụsị na-ebudata ụdị ndụ ha na-ebi. Ụbọchị 19 nke ọnwa Septemba kwa afọ bụ ụbọchị e ji agbasa ozi maka arụ agwọ. Nke a bụ ji mee ka ọhaneze lenye anya na nsogbua na-akpa ike na obodo dịga n'Afrịka, Asia nakwa South-Amerịka. N'ọtụtụ mba, ọgwụ agwọ e nwere anaghị arụcha ọrụ n'ihi etu e siri dokwaa ya maọbụ maka na e mere ya maka ụdị agwọ pụrụ iche , ọ bụghị agwọ niile. Ọtụtụ ndị ọkammụta sayensị akatọọla Glanville na Friede maka ihe =ha na-eme mana ha kwusiri ike na nchọpụta ha na-eme. Glanville sị, ""Anyị elebanyela anya n'ọrụ ji usoro e ji elebanye ihe ndị ọịzọ nwere ike itinye mmadụ na nnukwu nsogbu dịka mmerụ ahụ n'ọrụ maọbụ HIV."" Dịka o kwetara na ụzọ ọ gbaso agaghị adịị ndị ọzọ mfe, Tim Friede sịrị na ọ ga-amịta mkpụrụ. ""O nwere uru dị n'ekweghị ekwe m. Ana m etinye ndụ n'ihe egwu iji nwetara ụwa ọgwụ agwọ ozurumba ga-adị ọnụala.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49747894 +religion 'Ọ bụ okwu mmekọ nwoke na nwoke n'etiti ndị ụkọchukwu butere esemokwu n'ụlọụka Anglịkan dị n'Ezinifite' "Dịka ọtụtụ mmadụ ka na-ajụ ihe kpatara ndị Ezinifite jiri gbachie ụlọụka Immanuel dị na be ha ụbọchị ụka, ọnụ na-ekwuru Dayosis Anglican nke Aguata agwala BBC ebe mmiri siri banye n'akụ oyibo. Abụchị Nwozor sị na okwu ahụ malitere kemgbe afọ 2017 oge Dayosis ahụ mechara nnyocha were chụọ ụfọdụ ụkọchụkwu ""makana ha na-edina nwoke ibe ha."" ""Ihe meziri bụ na Ụkọchukwu na-ahụ maka Ezinifite, bụ Venerable Emma Ekejiuba, gara ebe a na-akwa ozu were kwuo na otu n'ime ndị a achụrụ enweghị ihe o mere were kpụọ ya ka o soro ya kpee ekpere."" Ọ sị na agwa Ụkọchukwu Ekejiuba kpara site ịkpọghachi onye achụrụ n'ọrụ ụkọchukwu ma kwuo na onweghi ih e o mere megidere iwu ndị Anglican na Naịjirịa. Maazị Nwozor gakwara n'ihu kwuo na aka Bishop Aguata bụ Samuel Ezeofor adịghị n'ihe mere karịcha na ọ bụ ya nyere Ven Ekejiuba ezumike nwagbenta. Ọ sị, dịka Bishop Ezeofor nụrụ ihe Ven Ekejiuba mere, ọ hibere kọmịtị maka nyocha ka a mata nke bụ eziokwu, mana ọ gọrọ. Ka emechara, a chọpụtara nọ ọ bụ eziokwu makana ihe o kwuru dị na ""tape"". Maazị Nwofor gakwara n'ihu kwuo na ya bụ obodo adaala jii dịka ụfọdụ ndị so mee nsogbu ụbọchị ụka na abịa ịrịọ mgbaghara. Ihe a Maazị Nwozor kwuru dabanyere n'ihe otu ụkọchukwu na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC n'ụbọchị Sọnde bụ ihe mere ndị ntoroọbịa Ezinifite ji were igodo gbachie ụlọụka Immanuel dị n'obodo ha. BBC kpọrọ Ụkọchukwu Ekejiuba ka anụta ọnụ ya o were sị ka akpọghachi ya. Mana oge eji kpọghachi ya, ekwentị ya anaghịzị aga. Kedụ ihe mere e ji kwụsị Archdeacon a ọrụ? Ụkọchukwu a sị na e nwere otu ụkọchukwu bụ nwafọ Ezinifite a chụrụ maka ebubo mmekọrịta nwoke na nwoke n'afọ ole na ole gara aga. Onye Archdeacon a gara akwamozu ma hụụ ụkọchukwu a, sị ya kpee ekpere gọzịe nri n'akwamozu ahụ. Mana iwu ndị ụka Anglican megidere onye ụkọchukwu a chụrụ achụ ịrụ ọrụ n'ụdị ọbụla, nke mere mgbe ozi ruru Bishọp ntị na ọ gbarụrụ ihu. Bishọp gara n'ihu kwụsịtụ Archdeacon a ọrụ n'ihi agwa ọ kpara ma zigaa onye ọzọ n'Ezinifite ka ọ nọchite anya ya na nchere oge. Ụfọdụ ndị ntoroọbịa Ezinifite anabataghị ya nke mere ha ji gbachie ụlọụka sị ka a kpọchịrị ha Archdeacon a kwụsịtụrụ ọrụ. BBC Igbo kpọrọ Bishop Samuel Ezeofor n'ekwentị ka a mata etu eke si anya anwụ maka ọ zabeghi rute ugbua akụkọ na-apụta. Cheta na ihe onyonyo na-efegharịnụ na soshal midia gosiri ka ndị ụlọụka Emmanuel Anglican Church Ezinifite dị n'Anambra steeti na-eme ngagharịiwe. O gosiri ebe ọtụtụ mmadụ kwụ n'ọnụ ụzọ ụlọụka ahụ na-ekwusike na ha achọghị ka archdeaconry ọhụrụ ewetere ha bata n'ụlọụka ha kama ka ewetere ha nke ochie ka pụchara tupu nke ọhụrụ a abata. Nke a mere ka ha were akwụkwọ e dere ""Uzọ anyị mechiri emechi"" madocha n'ọnụ ụzọ ụlọụka ahụ ka aghara ịka ụka taa ebe ahụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-54049830 +politics Sanusi Lamido Sanusi: Akụnaụba Naijiria na-achọ ndakpọ - Emir Sanusi "Emir nke Kano bụ Sanusi Lamido etiela mkpu maka ọnọdụ akụnaụba Naijiria, were kwuo na ọ na-achọ ndakpọ Ọ sị na ọ bụ n'ihi ego gọọmenti na-emefu dịka ego mgbakwụnye mmanụ (fuel subsidy) nakwa ọkụ latrik. Sanusi, rụtụrụ aka na Naijiria na-emefu ihe ruru pasent iri asaa n'ego na-abata n'akpa Naijiria n'ịkwụ ụgwọ e ji eji. Ma kwuo sị na ịga n'ihu gbakwụnye ihe ruru otu tari naira na ụma (N1.5Trillion) a na-akwụ maka na-agbakwụnye na mmanụ na ọkụ latrik(fuel subsidy) kwa afọ, Naijiria nọ na nnukwu nsogbu. Sanusi kwuru nke a n'ọgbakọ nkuzi nke onye na-ejide akpaego gọọmenti etiti(Accountant-General) hiwere na Kano ụbọchị Tuzde. Ọ gara n'ihu dụọ onyeisiala Muhammadu Buhari ọdụ ka o wepụ 'subsidy' na mmanụ agbịdị nakwa ọkụ latrik. ""Ala anyị na-akwado ndakpọ."" ""Ihe na-eme bụ na gọọmenti etiti na-akwụ ego mgbakwunye na mmanụ, n'ọkụ latrik, ọnụ eji ebi ego gbalite, gọọmenti akwụkwa ya."" ""Ihe kacha njọ bụ na anyị gbaghara itinye ego na agụmakwụkwọ, ọnọdụ ahụike nakwa ihe mmepe obodo na-achụ ịnweta mmanụ ụgbọala n'ọnụ ala."" ""Ọ bụrụ ezie, na Buhari chọrọ ịchụ ụbịam, ya wepụ nsogbu ihe a ga-ebutere ụlọakụ ga, ya wepụ ego mgbakwunye mmanụ."" Ọ gara n'ihu kpọọ Buhari oku ka ọgwa ụmụ Naijiria n'ezie ọnọdụ akụnaụba Naijiria dị ugbua ma gbaa mbọ gbaa ọsọ mmiri tupu ozobe, n'ihi na ""akpa ego Naijiria tọgbọ chakoo ugbua.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48765902 +sports Unai Emery na Arsenal agbaala alụkwaghịm "Arsenal achụọla onye nchịkọta ha bụ Unai Emery sị ya kwakọrọ pụọ maka na ọ naghị eme nke ọma. Onye kwuru nke a bụ Stan Kroenke so n'otu n'ime ndị nwe Arsenal n'ime ozi o wepụtara n'ehihie taa. Ha sị na Freddie Ljunberg ga-anọchitụ anya nwa mgbe nta ruo mgbe ha ga-enwete onye ọzọ dịka onye nchịkọta n'uju. Unai Emery bụbu onye nchịkọta Paris St-Germain na Sevilla maburu ọkwa ịchịkọta Arsenal n'ọnwa Mee afọ 2018. Ọnọdụ Arsenal na Manchester United bụzị agba ekpere chi Igbo sị 'ma agwọ emeghi ihe o ji bụrụ agwọ, ụmụaka ewere ya kee nkụ', nke a bụ ọnọdụ Arsenal na Man. United n'asọmpi Europa. Dịke Ịngland abụọ a gbara nkịtị ka 'ụmụaka' abụọ dịka Eintracht Frankfurt na Astana gbaa ha ukwu n'ala ụnyaahụ. N'agbanyeghi na Arsenal nọ n'ụlọ ha 'ọgbọegwuregwu Emirates' ma buru ụzọ nye ndị Frankfurt goolu na nkeji 45 site n'aka Pierre-Emerick Aubameyang. Ha nọkwa ebe ahụ na-ele anya mgbe Frankfurt si n'azụ saa goolu ahụ ma nyekwa goolu ọzọ bụ nke ha ji merie Arsenal. Goolu abụọ ndị Eintracht Frankfurt ji merie Arsenal si n'aka Daichi Kamada n'ime nke 55 na 64 n'ụsoro. N'aka nke ọzọ Manchester United bụ ndị Astana lere ọbịa, bu ụzọ nye Astana goolu site n'aka Jesse Lingard na nkeji 10. Mana Dmitriy Shomko nke Astana siri ọnwụ ma saa goolu ahụ Manchester United nyere na nkeji 55. Site mgbe ahụ gawazie Astana kwanyere Man. United ọkụ n'ike nke mere Di'Shon Bernard onye Man. United ji nye onwe ha goolu na nkeji 62. Nke a mere Astana ji were ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Manchester United na ngwụcha asọmpi a. Mmeri a e meriri Arsenal na Manchester United e meela ka ọnọdụ ndị nchịkọta ha bụ Unai Emry na Ole Gunnar Solskjaer bụrụ 'A gbaa e kperechi'. Ndị uweojii gara n'ụlọ agadi nwaanyị wee hụ ozu di ya n'ime 'freezer' Ndị uweojii gara ịza oku na be otu nwaanyị dị afọ 75 hụru na ọnwụọla mana nke tụrụ ha n'anya bụ na ha hụrụ ozu di ya n'ime ntụ oyi. Ndị uweojii sị na ha na-eche na aka mmadu adịghị n'ọnwụ nwaanyị ahụ aha ya bụ Jeanne Souron-Mathers di afọ 75. Ha sị na a hụru ya bụ nwaanyị ebe edina n'ala n'ọnwụ, mana ọ bụ ozu di ya ka ha che na ọkwụghi ọtọ makana o nọọla n'ime ntụ oyi ahụ afọ. Onye uweojii aha ya bụ Jeremy Hansen na mpaghara ""Salt Lake City"" sị na ya bụ ihe na ""esi isi. Agbanyeghi nke a, ndi uweojii si na ha amaghị ma aka nwaanyi ahụ ọ dị n'ọnwụ di ya. Ndị ọgbataobi ha sị na otela ha hụrụ nwoke ahụ. Ụfọdụ sị otu afọ ebe ndị ọzọ sị na oruola afọ iri na otu. Mba Amerịka na-ekwuola na mmadụ niile dị afọ iri abụọ na otu gbadawa na-arụ ọrụ maọbụ na buru nwa onye ọrụ na ụlọ mmekọ ha na Burkina Faso kwakọrọ lawa. Nke a na-abịa dịka ha sị na ọnọdụ nchekwa na mba ahụ. N'ime akwụkwọ mgbasaozi ha wepụtara,ndị na-anọchịte anya Amerịka na Burkina Faso sị agbanyeghi na onweghi ihe ha nwereike rụtụ aka na ọ bụ ya kpatara ihe a ha kwuru, ọnọdụ nchekwa na ya bụ mba eruola ebe ọ gaghi amasị ụmụaka ịnọ n'ụlọ ọrụ ha. Ndị ọrụ ndi ọzọ ka ga-anọ. Nke a na-abịa dịka mba Amerịka wepụtara ndụmọdụ o nyere ndị be ha, nke sị ha gbanri ịga mba Burkina Faso maka mkpa mkpa ndi oyi ndu egwu na-akpa na ya bụ mba. Ndi oyi ndu egwu na-enyue ezigbote nsogbu na mba ahụ nke gunyere ị na-agagharị na-achọ ndị ha ga-awakpo." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50584003 +health Coronavirus in Africa: Ahụhụ anyị na-ata n'inyocha ndị mmadụ ahụ maka coronavirus Ndị ọrụ ahụike na Saụt Afrịka akọwala ihe ha gabigara dịka ha na-agagharị inyocha ndị mmadụ ahụ maka ọrịa coronavirus. Otu n'ime bụ onye nọọsụ bụ Tshego Selona sị na tara ahụhụ dị iche iche n'oge nyocha a nke gụnyere ịgbahapụ ezinaụlọ ha, ibute coronavirus, ọnwụ na ihe ndị ọzọ. Ọ sị na ndị mmadụ na-asọ ha asọ maka na ha nwereike ibunye ha ọrịa coronavirus. Selona sị na ga anaghị ehi ụra ọfụma n'abalị dịka ha na-agba mbọ ịgazu mpaghara ime ime obodo Saụt Afrịka. O kwukwara na ọtụtụ ndị ọrụ ahụike ibe ya nwụrụ n'ọrịa mana ọ gbakere na-agbanyeghi na o butere ọrịa a. Kirie ihe o kwuru n'uju: https://www.bbc.com/igbo/afirika-55124629 +sports Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: CAF na-ajụ ihe mere Afrịka emeghị nke ọma n'Iko Mbaụwa Gịnị mere otu Afịrịka agbaghị nke ọma n'Iko Mbaụwa - CAF Onyeisi ọhụrụ nke otu CAF bụ Ahmad Ahmad, ekwuola na oge eruola ka ndị na-elekọta otu bọọlụ dị iche iche na mpaghara Afrịka zara ajụjụ ịchọpụta ihe mere otu dị iche iche si Afrịka agbaghị nke ọma n'asọmpi Iko Mbaụwa. Ebe otu Everton ji nde pounds iri ise zụrụ ọgba bọọlụ Richarlison. APC kwụsịrị ike - Buhari Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na otu pati ha bụ APC kwụ chịm n'agbanyeghị na ọtụtụ ndị omeiwu apụọla gawa PDP na ADC. Buhari kwukwara na onweghị ihe ọjọọ o bu n'obi gbasara ndị a pụrụ. Titus Uba bụ onyeisi ọhụrụ ndị omeiwu Benue steeti Ndị omeiwu Benue steeti ahọpụtala Titus Uba dịka onyeisi ọhụrụ ha. Nke a mere dịka ndị omeiwu na steeti a ruru iri atọ binyere aka n'akwụkwọ ịchụtụ Terkimbi Ikyange dịka onyeisi ha. Ha boro Ikyange ebubo isi ike nakwa iji ọkwa ya emegide ndị omeiwu ibe ya na steeti ahụ. Ha ka na-achọ ndị mmadụ na Greece Na mba ofesi, ndị gbatagbata ka na-achọ ndị dị ndụ n'ebe ọkụ gbagburu mmadụ ruru iri asaa na anọ na mba Greece. Onyesisiala ahụ kwuru na ha ga-eji ụbọchị atọ wee ruo uju. Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a Lee ihe nkiri anyị https://www.bbc.com/igbo/afirika-44950341 +health World Malaria Day: Ihe ise ịba jiri dị iche na Taịfọd Ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-arịa ọrịa taifọd na-eche na ha na-arịa ịba n'ihi mgbagwoju anya dị n'ọrịa abụọ ndị a. Ịba nke Bekee kpọrọ 'malaria' bụ ọrịa a na-ebute ma akwụnta tanye mmadụ nje bu ọrịa n'ahụ, ebe taifọd bụ ọrịa a na-ebute site nje a kpọrọ, 'Salmonella Typhi' nke na-aṅụta na mmiri adịghị ọcha maọbụ nri mebiri emebi. Ịba na Taifod bụ ọrịa abụọ a na-arịakarị na mpaghara Afrịka. Dịka WHO siri kwuo, ịba na-egbu ihe karịrị mmadụ 400,000 kwa afọ, ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụaka. n'aka nke ọzọ, ngụkọ nke WHO mere n'afọ 2019 na-ekwu na mmadu ruru agbata nde iri na otu na iri abụọ na-arịa taifọd kwa afọ. Taifọd na-ebutekwa ọnwụ mmadụ ruru agbata puku,otu nari na iri abụọ na asatọ(128,000) na putu otu nari iri isii na otu(161,000). BBC gbara ọkachamara ahụike bụ Dkta Ikechukwu Okoroafor nke ụlọọgwụ, Mount Sinai Hospital, Lagos, ajụjụọnụ banyere ihe dị iche n'etiti ọrịa ịba na taifọd. Nke a bụ ihe Dkta Ikechukwu Okoroafor kwuru maka ọrịa ọjọọ abụọ a: Gee ihe ise iba jiri dị iche na Taịfọd n'ọnụ Dr Ikechukwu Okoroafor: https://www.bbc.com/igbo/afirika-43198960 +politics House of Rep Principal Officers: 'Femi Gbajabiamila sị na iwe ya bụ na PDP etụnyeghịrị ya na ntuliaka' "Ọnụ na-ekwuru onyeisi ndị PDP bụ Ike Abonyi ekwuola na pati ha ma na ihe na-eme n'ụlọnọchite anya nta gbara ọnye ga a bụ ""Minority Leader"" bụ mgba okpuru. Abonyi kwuru na PDP ehiwela kọmiti ga-elebe anya na ya bụ okwu mara ebe ya bụ mmiri sị banye opi ụgbọnyiri. Ọ sị na ya bụ kọmiti nke ndị isi pati ha na ndị ọkpamkpọ hibere na Tuzde nwere otu izuụka iji kwuo nchọpụta ha. Abonyi sị na ""ọrụ kọmiti a bụ ịchọ ka ga-esi weta udo"". Ọ kwesiri ike na ọ bụ mgbaokpuru mere onyeisi ụlọnta omeiwu bụ Gbajabiamela ji hapụ aha pati nyere ya kpọwa ọzọ. Ụlọnọchite anya nke nta enweghị ezumike kemgbe izuụka gara aga maka okwu ihọpụta onye isi pati akacha nke atụrụ anya na ndị pati niile bụ ndị anọghị n'ọchịchị ga-ewepụta. Onyeisioche ya bụ ụlọnọchite anya bụ Femi Gbajabiamila kpọpụtara aha Ndudi Elumelu (PDP) dịka onye pati ndị a niile chọrọ. BBC gbara ndị ihe a metutera ajụjụ ọnụ ịmata nke bụ eziokwu. Kingsley Chinda, onye bụ onye PDP kwadoro gwara anyị uche ya. Chinda sị na ya atụghị anya na ya bụ okwu ga-aga ka ọ gara maka na uche ya adịghị na ya bụ ọkwa maka na ọ bụ nhọpụta ka a na-ahọpụta onye ga-anọ na ya, na ọ bụghị ntuliaka. Okwuru n'ọgbakọ pati niile anọghị n'ọchịchị ugbua nwere n'Abuja na ha niile tikorọ isi ikwu udi ihe onye ga-anọ na ya bụ oche Minority Leader kwesiri ịnwe. Chinda sị na ""mmadụ ise họpụtara m ebe otu onye họpụtara Ndudi Elumelu."" Ndị bịara ya bụ ọgbakọ gara n'ihụ ịgwa ndị isi ka ha ga nyocha mmadụ abụọ ahụ ahọpụtara ma nye ha otu onye. Akpọrọ ọgbakọ ọzọ n'abalị mbụ nke ọnwa Julaị ebe pati niile anọghị n'ọchịchị gbakọrọ ma lebe ka ndị nke Sineti siri mee nke ha. Ebe ahụ ka Tobi Okechukwu kwuru na ndị Ọwụwa Anyanwụ ga-achọ ka ewere ntuliaka wepụta onye ga-anọchite anya ha karịa nhọpụta dịka emere na mbụ. Wole Oke kwukwara ndị otu ha n'Ọdịda Anyanwụ kpokotara mbinyeaka ndị otu ha. Ndị isi rịọrọ ka ahapụ aha ndị nke họpụtaburu ka ha gawa kemgbe ọ bụghị iwu na a aga eji ntulika wepụta ndị ga-anọ na ya bụ oche. Onye APGA bụ Presige Osy rịọrọ na kemgbe etinyeghị ha na oke nke a, na ha ga-achọ ka echetakwa ha mgbe ọzọ a ga-eke ọkwa. Chinda kwuru na ""iwu ụlọnọchite anya bụ na pati ọbụla na-erughị iri agaghị anọ n'isi oche obụla. Kemgbe APGA bụ ndị nwere oche itoolu anaghị atụ anya isi oche ọbụla"". Ekwere ha nkwa na a ga-eme ka ha soro n'ihe a na-eme. Chinda sị na-emechere hụ ka ụfọdụ na-ebugharị akwụkwọ na-arịọ ka ndị otu ha na-etinye aka. ""Anyị amaghị ihe ha chọrọ iji ya bụ akwụkwọ mee."" Ọ sị na ya gara n'ụlọọrụ onyeisi ya bụ ụlọnọchite anya nke nta bụ Femi Gbajabiamila ịjụ ya ma onwetala akwụkwụ ndị pati PDP deere ya maka nhọpụta ha mere, ọ sị na ya nweteghị ya. Chinda sị na mgbe ya gachiri azụ ịjụ ya, ka Gbajabiamila gwara ya na onwere aha ndị ọzọ enyere ya nke ndị pati ndị ọzọ niile tinyere aka, ọ bụ nke ahụ ka ya ga-agụpụta. Ọgwakwara ya na PDP etinyeghị ya na ntuliaka, ya mere ya agaghị akpọ aha ndị nke ha ziteere ya. BBC kpọrọ Toby Okechukwu na Ndudi Elumelu mana ha azaghị ekwenti" https://www.bbc.com/igbo/afirika-48928763 +business Border closure: 'Gọọmentị agwaghị anyị tupu ha emechie Border' - Ndị na-atụbata ahịa "Ọnụ na-ekwuru ndị 'Association of Nigerian Licence Custom Agents' (ANLCA) bụ Austin Nwosu kwara arịrị sị na mmechị e mechiri oke ala Naịjirịa na Benin Republic bụ oke njọ ahịa dịri ndị otu ha. Ọ sị na gọọmentị agbaghịrị ha ama tupu e mechie okeala a nke bụ na ahịa ndị mmadụ bitere ego zụọ ka tọrọ n'ụzọ. Nwosu sị na ya bụ ""Okeala e mechiri n'ọnwa asatọ nke afọ a bịara ha na mberede"". Ọ sị na gọomentị gwara ha na ọ bụ ama a gbaara ha maka ndị omekome chọrọ iji ụzọ aghụghọ bubata ahịa iwu mere ha ji mechie ya bụ okeala. Nwosu sị na ha jụrụ ha ihe ngwaahịa ndị ezigbo mmadụ so ụzọ ahụ ga-eme? Ndị ọrụ nchekwa ahụ sị ha na-arụ ọrụ gọọmentị dịka e sị zie ha. ""na onweghi ihe ha ga-eme"". Ọ sị na ọ rara ahụ i si mba Benin Republic bụbata ngwaahịa ugbua. O kwuru na ibu ọtụtụ mmadụ bitere ego n'ụlọakụ bụ nke na-amụwabanye ruru naịra iri na asatọ kwa ụbọchị maka ụgbọala bu ibu. Ọ sịkwa na ndị ekperima na-ezukwa ọtụtụ ngwaahịa ụmụigbo nọ n'ụzọ ebe ahụ. Nwosu sị na mmechi a emetutachaghị ahịa osikapa maka na ọ bụ ahịa iwu kamgbe. N'olu ya, ""ọ bụghị ụzọ ahụ ka ha na-esi aga"". Mana o kwukwara na ihe mere osikapa ofesi ji aga ahịa bụ maka na nke akọrọ na Naịjirịa ka adala ọnụ. Nwosu na-arịọ ndị gọọmentị ka ha kawa ahụ mee ka ezigbo ahịa na-abata na Naịjirịa ma 'ghara itufu nwata na mmri e ji saa ya ahụ'. Ihe nkiri ga-amasị gị" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49808584 +politics Buhari ka na-ekwusi ike na Boko Haram enweghịzị ume "Onyeisiala Buhari ka na-ekwusi ike na ndị agha Naịjiria emenyụọla ndị oyi egwu Boko Haram anya. Buhari kwuru nke a oge o zutere onyeisi ndị Red Cross bụ Peter Maurer n'Abuja. O kwuru na ọ fọdụrụ obere ka ndị agha Naịjirịa na nke ndị mba gbara ya gburu gburu kpochapụ Boko Haram kpam kpam. N'okwu ya, ""Anyị na mba Chad, Kamerun, Nijie Repọblik na ndị ọzọ na-adọkọta ukwu."" ""Ndị agha ụgbọelu anyị na-emekwa nke ọma."" ""Ndị Boko Haram bụ ndị ekperima, anyị ga na-akpasokwanụ ha agwa ka ndị ekperima."" Buhari kwukara na ọchịchị ya na-agbazi mbọ ugbua idozi ihe niile ndị Boko Haram mebiri, ma kpọghachikwa ndị niile gbapụrụ ọsọ ndụ. N'okwu ya, Peter Maurer kwere nkwa na ndị otu ya (ndị Red Cross) ga na-agba mbọ inyere ndị mmadụ aka, etu ha nwere ike. Taa ka okwe ga-agba n'ikpe dị n'etiti onyeisiala Muhammadu Buhari na Atiku Abubakar iji mata onye meriri ntuliaka e mere n'ọnwa Febụwarị afọ 2019 maka nhọpụta onyeisiala Naịjirịa. Atiku na ndị otu ya bụ PDP na-ebo ebubo na Buhari na ndị otu ya bụ APC mere nrụrụaka dị egwu na ya bụ ntuliaka. Ha na-akọwatakwa na onyeisiala enweghi asambodo zuru oke iji zọọ ọkwa onyeisiala. BBC kwụ chịm n'ụlọikpe mkpesa dị n'Abuja iwetara gị akụkọ a n'uju. Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump enyela onye ndụmọdụ ya gbasara nchekwa obodo aha ya bụ John Bolton ọsọ. Trump kwuru na ya anaghị ekwenye na ndụmọdụ ụfọdụ Bolton na-enye ya, nke a kpatara o ji sị ya laa. Mana Bolton na-ekwu na ọ bụ ya ji aka ya gbaa arụkwaghịm. Bolton kwukwara na ụwa ga-anụ olu ya oge na-adịghị anya. N'egwuregwu, ndị otu Super Eagles maliri elu ka Agụ ma wụọ chọm ka nwa Awọ n'asọmpi enyi na enyi ha na ndị Ukraine gbara ụnyaahụ. Ụmụ Naijirịa jibu goolu abụọ emeri na ya bụ egwuregwu, mana Yukren tụgharịrị sachaa goolu abụọ ahụ n'otu ntabi anya. N'aka nke ọzọ ndị otu egwuregwu bọọlụ Naịjiria na-erubeghi afọ iri abụọ na atọ meriri mba Suda ụnyaahụ. Otu abụọ ahụ zutere onwe ha iji mara onye ga-etozu oke isonye n'asọmpi Afcon nke ndị erubeghi afọ iri abụọ na atọ. Naijirịa ji ọkpụ goolu ise asataghi asata menyụọ Sudan anya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49660046 +health Covid-19 Outbreak: ‘Dike’ isii pụtara n'oge coronavirus a Akụkọ a bụ maka mmadụ isii n'ime ha, nwereike ikpalite mmụọ gị. Nwaagbọghọ onye dụọdụọ e jiri uwe eji achọ mma mara, esila na ya bụ njirimara ha banye n'ịdụ uwe ndị ọrụ ahụike na mba Libya. Nke a ha na-eme bụ ọrụ akwụ ụgwọ ụmụagbọghọ ndị ahụ ji enyere aka n'oge ugbua, nke ne-emecha ka ha na-arahụ n'ọrụ mgbe ụfọdụ. Ha akwapụtala ụwe ndị ọrụ ahụike iri ise kemgbe ha malitere, ma banye n'ịkwapụta ọtụtụ ọzọ. Ndị ọrụ ahụike Tripoli Hospital jara ha ike maka ọrụ ha. Najwa Taher Shokriy bụ onye nwe ya bụ ụlọọrụ, gwara BBC na ya bụ atụmatụ malitere mgbe otu dọkịnta nke ụlọọgwụ al-Jalaa Hospital nke dị na Tripoli rịọrọ ndị achụmntaego enyemaka. Shokriy bụ onye malitere ịkwa uwe otu afọ gara aga, sị na ọ bụghị ụkpa ekele a na-enye ya ugbua dị ya mkpa, kama na ọ bụ inyere aka maka ibuso coronavirus agha. O kwuru na obi ya dị n'ịkwapụtakwu ọtụtụ uwe ndị ọrụ ahụike, mana enweghị ngwaọrụ na-echere ha aka mgba. Ọrịa coronavirus emeela ka a kagbuo ọtụtụ agbamakwụkwọ nke mere na ahia flawa anaghị agazị. Mana ụfọdụ ndị ọrụ ha bụ ikụ nakwa ire flawa n'obodo Paarl, Saụt Afrịka gbakọtara ime ka ya bụ ụsụahịa bụrụ uru. Nke a mere ndị ọrụ Adene Farm jiri were flawa ha chọọ Huis Vergenoegd Old Age Home bụ ebe ndị kara nka na-ebi, mma. Ndị okenye bị n'ụlọ ahụ nọ n'ime ụlọ maka ọrịa coronavirus, mana a hapụrụ ha ka ha pụta gbaara anya ha ekeresimesi n'Epreelụ. Ndị mmadụ na-agafe jakwara ha ike. 3) Otu onye nwe ụlọ sị ndị bi n'ụlọ ya akwụla ụgwọ ụlọ Onye nwe ụlọ nke Bekee kpọro 'landlord' sị mmadụ iri atọ na anọ bi n'ụlọ ya akwụla ụgwọ ụlọ n'ọnwa Maachị na Epreelụ n'ihi etu coronavirus si metụta achụmntaego. Michael Munene nwere ọnụụlọ iri abụọ na anọ ebe a na-akwụ ya dọla 30 kwa ọnwa na mba Kenya. Nermine Sfar bụ ote egwu mba Tunisia sị na ya na-ete egwu n'ihe onyonyo iji mee ndị mmadụ obi ụtọ dịka ha nọ n'ime ụlọ ha maka ọrịa coronavirus. Ọ na-ezipu egwu ya ngwa ngwa dịka ọ na-agba ya n'ịntanetị, nke nde kwuru nde mmadụ na-ekiri dịka ha nọ n'ụlọ ha ugbua. Ọ malitere ịgba egwu a tupu e tie iwu mmachibido ndị mmadụ ịpụta ezi n'ụbọchị 29 nke ọnwa Maachị. Ọgụegwu mba Itiopia bụ Hamelmal Abate enyela ụlọ ya ka e were ya mere ebe a ga-edowe ndị nwere nje coronavirus. N'ọnwa Maachị, gọọmentị mba Itiopia gwara ndị ọbụla si njem ofesi bata mba ahụ na ha ga-anọ n'ụlọndina ihe ruru izuụka abụọ, bụ nke ha ga-akwụ ụgwọ ya ruo mgbe ha ga-anọcha mmachibido maka nnyocha (quarantine) ha. Abate bụ onye aka ya chawara n'ịgụ egwu kemgbe 1990, gwara onyentaakụkọ BBC bụ Kalkidan Yibeltal na ya bụ atụmatụ dị mma maka ndị ji ego ga-emeli ihe dị n'ime ya. Ochee goolu ndị Plateau United bụ Chinedu Anozie, nyere mmadụ atọ ego nri ka ha were nwee ike ịnọ n'ụlọ n'oge coronavirus a. Chinedu nyere ndị nkwado ya mmadụ atọ puku naịra ise ka ha were 'kụwa abụ' dịka ha nọ n'ụlọ ugbua. https://www.bbc.com/igbo/52163829 +health Parasomnia : Etu nwoke si jiri anya ụra bepu 'akpa school' ya na mberede "Otu nwoke nọ n'ụlọọgwụ ugbua dịka o ji anya ụra bepụ ihe o ji bụrụ nwoke na-amaghị ama. Kofi Atta, bụ nwafọ n'Assim Akomfode dị na mpaghara etiti mba Ghana nọ n'ọnọdụ ọjọọ n'ụlọọgwụ gwara BBC na ""Ugbua anọ m n'ụlọọgwụ ebe a na-elekọta m."" Nwoke ahụ gbara afọ 47 mabụrụ onye ọrụugbo kwurukwara sị, ""A na-agba m ọgwụ ma kwụnyere m mmiri. ""A sị na e kwesịrị ịwa m ahụ mana enweghị m ego a ga-eji tinye m n'ụgbọala 'ambulance' ga-ebuga m nnukwu ụlọọgwụ Komfo Anokye Teaching Hospital (KATH) maka ịwa m ahụ."" Ụwa gbara Kofi Atta gharịrị n'ọnọdụ ọ hụrụ onwe ya dịka ụra foro ya n'anya. Ndị agbataobi ya mmadụ abụọ hụrụ na-a ọ na-agba ọbara . O tetara n'ụra ebe ọnọ n'oche arahụ ụra, nnụkwu ụfụ fụrụ ya n'ebe ihe o ji bụrụ nwoke. Ọ bụ oge ahụ ka ọ matara na o bepuru 'akpa school' ya na-amaghị ama dịka ọ na-arọ nrọ. "" Echetaghi m oge m were mma, ya bụ ihe gbagwojuru m anya."" Na-agbanyeghị na ndị agbataobi ya hụrụ ya ma buru ya gaa ụlọọgwụ , Atta na-ahụ ihe mere ya dịka ọ bụ na nrọ rue oge ọ hụrụ onwe ya n'ụlọgwụ. Ọ kọwara na ya na-arọ ebe ya na-ebe anụ ọ ji esi nri n'ụlọ ya. A na-ede na nsogbu ya bụ ọnọdụ ahụike a kpọrọ 'Parasomnia' na Bekee. Nke a bụ ọnọdụ ịnọ n'ụra mụrụ anya. Ndị ọnọdụ a na-eme dịka ọbaozi ahụike 'Healthline si kọwaa, na-anọ n'ụrụ na-akpagharị maọbụ na-eme ihe dịwara aṅa dịka ịnọ n'ụra na-ekwu okwu, ịnọ n'ụra na-agagharị, ịnọ n'ụra anyụ mamịrị maọbụ na-arọ nrọ nrọ." https://www.bbc.com/igbo/articles/cxwm1wdrxd0o +politics Ụlọikpe ukwu sị na iwu akwadoghị mwepụ Madumere Eze Madumere enwerela mmeri n'ụlọikpe Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ụlọikpe ukwu akagbuola nchụpụ ahụ a na-achọ ịchụpụ osote gọvanọ Imo steeti bụ Eze Madumere. Ọkaikpe Benjamin Iheaka kwuru na ya bụ usoro achọrọ iji chụpụ Madumere adịghị n'akwụkwọ iwu ala Naịjirịa. Otu pati APC adọọla Uche Secondus nke PDP aka na ntị maka ajọ okwu ha sịrị na ọ gwara ha. N'akwụkwọ nke onye osote odeakwụkwọ mgbasa ozi APC tinyere aka, ha sị na ọ bụ ịkpụ ugwu ya n'ala site n'ibo ebubo na APC na Inec gbara ha mgba okpuru na ntụlịaka e mere n'Osun steeti n'izuụka gara aga. Na elenu o, ka ọgbakọ mbaụwa UN na-aga n'ihu ugbua ebe a na-atụ alo maka udo na nchekwa tọrọ atọ n'ụwa, Donald Trump nke Amerika emeela ka ngwere dara elu. Donald Trump kpapụrụ ndị isi ibe ya ọchị ka ọ sị na gọọmentị ya arụọla ọrụ ndị ọzọ arụnwụghị n'afọ abụọ ọ chigoro. N'egwuruegwu, nna na nwa ga-akwakọta mpi mgbe otu Derby County ga-ezute `Manchester United n'elekere asatọ nke abalịa. Cheta na Frank Lampard bụ onye nkuzi ndị Derby ugbua mụrụ ọrụ n'aka Jose Mourinho oge ha nọ na Chelsea. Minista na ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekwuola na asiri ndị mmadụ na-agba na ọ bụ enweghị ndị nkwado mere ya bụ ụlọọrụ ụgbọelụ jiri pịachie nkụ bụ ụgha. Sirika sị ya bụ ụlọọrụ ụgbọelụ nwere ọtụtụ ndị ụkwụ siri ike n'ala bụ ndị nwere mmasị ịsonye na ụlọọrụ Air Nigeria. Gee nkeji anyị Luka Modric enweela mmeri Luka Modric bụ onye FIFA turu ugo dika onye kachasị agba bọọlụ na ụmụnwoke n'afọ a. Marta Vieira da Silver bụ onye turu ugo nke ndị ụmụnwaanyị. Mohammed Salah bụ onye turu ugo dịka onye nyere goolu nke kachasị tụụ ụtọ. Ndị ntọ atọhapụọla ndị njem so God is Good? Ha tọrọ ndị a n'ime izuụka abụọ garaaga. Mana ndị ntaakụkọ Premium Times dere na ụfọdụ ezinụlọ kwuru ego ntọhapụ tụpụ ha atọhapụ ndị be ha. Ndị uweojii gwara BBC Igbo na ha ka na-eme nchọpụta maka ihe mere, ma kwụkwa na ọ bụ eziokwu na-onwere ndị a tọọrọ. Gịnị na-eme n'Osogbo? Egwu dịkwa n'ọfọdụ ebe n'Osogbo isi obodo Osun steeti o. Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ụda egbe dara na mpaghara Alekuwodo n'ime steeti ahụ ụnyaahụ. Cheta na Alekuwodo bụ otu n'ime obodo a ga-eme ntụlịaka ọzọ ga-ahọpụta gọvanọ nke steeti ahụ. Akụkọ kwuru na mgbọ meruru nwa nwaanyị dị afọ iri na abụọ na ụmụnwoke abụọ ahụ na ọgbaghara ahụ. N'ofesi Ndị so n'ime nkwekọrịta nụklịa nke mba Iran ekwuola na ha ga-achọpụta ụzọ ọhụrụ ha na mba Iran ga na-azụ ahịa agbanyeghị na Amerịka esepuola aka na ya bụ nkwekọrịta. Mana ọtụtụ ndị amamihe gbasara okwu a na-ekwu na ọ ga-afịa ahụ makana ego Iran adaala kamgbe Amerịka sepuru aka na yabụ nkwekọrịta. Gee nkeji anyị Lee ihe nkiri nke ụtụtụ a https://www.bbc.com/igbo/media-45637256 +health Eye care: Ihe ise ị ga-eme ka anya gị ghara ịkpọ Anya mmadụ bụ ugogbe o ji ahụ ụwa. Ya mere o ji dị mkpa ka ọ kpachapụrụ ya anya. Onye ọkammụta n'ihe gbasara ilekọta anya bụ Nneoma Sibigam kwuputara ihe ise i ga-eme iji chekwa anya gị. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Adline Okere https://www.bbc.com/igbo/media-52689091 +politics Nnamdi Kanu na-ekwu uche ndị Igbo niile - Bishop Onuagha, Methodist Church, Onitsha Diocese Bishop ụka Methodist bụ Livinus Onuagha ekwuola uche obi ya maka ihe gbasara mwuchi gọọmentị nwụchịri Nnamdi Kanu. Onuagha kwuru na Nnamdi Kanu na-ekwu ọnụ ndị Igbo ma sị na nwụchi anụchịri Nnamdi Kanu abụghị nsogbu Naijirịa. Gee ihe o kwuru n'uju ya.: https://www.bbc.com/igbo/afirika-57754820 +health Hydroxycholoquine: Ihe ị kwesiri ịma maka etu ọgwụ a si metụta covid-19 - Dkt Ije Akunyili "Dọkịta Ije Akunyili bụ onye na-agwọ ọrịa mberede nke Bekee na-akpọ ""Emergency Medicine"" na mba Amerịka. Ọ bụ onye na-elekọta ndị na-arịa coronavirus ""n'abalị, n'ụtụtụ nakwa ehihe"", dịka o si kwuo. Dọkịtan Akunyili tinyere ọnụ n'ihe banyere ọgwụ ịba a na-akpọ hydroxychloroquine, Zinc nakwa zithromax, ọkachasị etu ha siri bụrụ ihe ndị eji agwọ covid-19. Dọkịta Akunyili gbadoro ụkwu n'ala kwusie ike na onwebeghị nchọpụta kwadoro atụmatụ iji hydroxychloroquine gwọọ coronavirus. Ọ gakwara n'ihu kwuo na Zinc na Zithromax abụghị ọgwụ a na-aṅụ ma ọ bụrụ na ọ bụghị ndị dọkịta sị mmadụ ṅụọ ha. ""Nsogbu ha na-enye n'ahu ka ihe a na-erite na ha."" Gee ya ntị ọfụma n'akụkọ a o meere BBC Igbo." https://www.bbc.com/igbo/afirika-53620523 +entertainment Flora Nwapa: Nwaanyị ike zara Ogbuefi na ndụ ya "E nwereike ịgụpụta ndị odeakwụkwọ si Naịjirịa ghara ịkpọ aha Flora Nwanzuruahu Nkiru Nwakuche Nwapa? Ọ dị egwu! Nwapa bụ ""a takata a gbọo"" n'ide akwụkwọ, nke mere ka ụmụnna ya chie ya Ogbuefi ma mee ka mbaụwa mara onye ọ bụ. Tupu ndị mmadụ etibe mkpu maka ịbụ ""feminist"" n'ọgbaraọhụrụ a, Nwapa akpawala ike n'ụzọ nke ya iji gosi na ọ bụ ihe ọ bụ. Ọtụtụ akụkọ o dere bụ maka ihe nwaanyị na-agabiga ma n'ala Igbo ma na Naịjirịa." https://www.bbc.com/igbo/afirika-54478743 +business Hair and Nail Designer: Ihe m ji bụrụ ọkaibe n'ime isi nakwa mbọ ụmụnwaanyị - Kizito Onyeka Okoye e ji Kizito maara ekwuola na ọ kuzierela ụmụ ntoroọbịa karịrị iri ise etu e si eme isi nakwa mbọ ụmụnwaanyị. O kwukwara na ọ bụ ụmụnwoke kacha amụta ọrụ n'aka ya ọsịsọ makana ha na-etinye uchu n'ọrụ ịchọmma n'ihi na ọ na-enye ego. Kirie ihe ndị ọzọ o kwuru gụnyere etu o si bido, ihe ndị chere ya aka mgba nakwa ebe ọ nọ ugbua. Ọ bụ Chigozie Ohaka na Chiemela Mgbeahuru mere akụkọ a https://www.bbc.com/igbo/afirika-59383943 +entertainment Mummy GO gwara BBC ihe ndị a maka onyonyo ya na-efegharị na soshal midia "Evangelist Olufunmilayo Adebayo e ji Mummy GO mara ekwuola na ọtụtụ onyonyo na-egosi ebe ọ na-ekwu okwu ,na-efegharị na soshal midia bụ nke akpara aka. Ọ gwara BBC Pidgin na ọbụghị ya kwuru ụfọdụ okwu a na-ebo ya ebubo ya. ""Ọ bụghị m kwuru ihe ndị ahụ, a na-akpa ụfọdụ onyonyo ndị ahụ aka . ọ bụrụgodi na ekwensu bụrụ ụkochukwu taa, ọ ga-ekwu ihe ndị ahụ? Ekwensu agaghị ekuli ihe ndị ahụ ma ya fọdụrụ ụkọchukwu kpọrọ onwe ya onye dị nsọ, ndị a na-eme ihe a emewela ya kamgbe afọ asatọ."" Olufunmilayo Adebayo bụ onyeisi ụlọụka Rapture Proclaimer Evangelistic Church (RAPEC) dị n'Ota, Ogun steeti. ""A rụọla m ọrụ ụkọchukwu ihe karịrị afọ iri abụ na anọ,"" dịka Mummy G.O si gwa BBC pigdin. ""Mana mgbe chineke kpọrọ m, oruola ihe dịka afọ 27, ihe chineke gwara m bụ ka m gwa ndị mmadụ maka ihe ha ga-eme iji gaa eligwe maọbụ gbanahụ ọkụ mmụọ makana na Jizos na-abia ọzọ ịkpọrọ ndị nke ya, ma ndị mmadụ achọrọ inụ ma ha achọghị."" ""Iwe anaghị ewe m maka aha Mummy GO ụwa nyerela m ugbua. Ọ bụ aha ọhụrụ."" Evangelist Olufunmilayo gaferala afọ iri ise kwuru na ije ya ibụ ụkọchukwu abụghị nke na-aga siriri werere. ""Esobu m ike ọchịchịrị arụ ọrụ mgbe mbụ , na-ebuso ndị ụka agha nakwa ndị ụkọchukwu mana mgbe Jesus Christ zutere m, e bidoro m meminawa ike ọjọ nile ahụ."" Cheta na soshal midia nwuru ọkụ maka Funmilayo Adebayo, nwaanyị a ma dịka Mummy G.O' maka ụdịrị oziọma ọ na-enye ndị ụka ya. Soshal midia enwụrụla ọkụ maka Funmilayo Adebayo, nwaanyị a ma dịka Mummy G.O' maka ụdịrị oziọma ọ na-enye ndị ụka ya. Mummy G.O, onye ndu ụka 'Mountain of Solution' dị n'Ogun steeti ekwuola ọtụtụ ihe na-agbaka ndị mmadụ isi dịka ọ gụtara ihe ndị nwere ike ibuga mmadụ ọkụ mmụọ. Ihe ndị a dịka o siri kwuo gụnyere iyi 'jeans' traụza, iyi okpunnabueyi, na ihe ndị ọzọ. N'otu ozi ya, ọ sịrị: ""Mụ na Lucifer anọọla. Ihe kachasị amasị ya bụ aramara."" Lucifer na-enwe mmekọ kwa ụbọchị. Ị ma na Lucifer na aga ndị mmadụ Akwụkwọ? Ọ lụr��� Rihanna, Ọ lụrụ Lady Gaga."" N'ozi ọzọ, Mummy GO kwuru sị, ""Onye ọbụla na-agba egwu 'break dance' bụ onye nwụrụ anwụ, maka na egwu ahụ si n'aka Michael Jackson pụta na-ego ọkpụkpụ 'skeleton' ndị nwụrụ anwụ."" Ọ sịkwa, ""Tupu m echegharịa nwere ndụ m nye Kraịst, a bụbu m onye na-ebu ọgwụ ike ""Cocaine"". ""Anabụ m eresi ndị omekome egbe ha ji akpa ike, abụbu m onye na-egbu ndị mmadụ, mụ na ọtụtụ ndị omekome na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-arụkọ."" ""Mgbe m na-ebu ọgwụ ike ""Cocaine anaghi m eji ụgbọ elu naani ute ndị mmụọ ka m ji efeghari ebu ya bụ ọgwụ ike site na mba Germany fega mba Amerịka"". Ihe ndị a niile emeela ka ọtụtụ mmadụ kpụrụ ya n'ọnụ ugbua ma jiri ya na-eme ihe ịkpa ọchị." https://www.bbc.com/igbo/afirika-59864963 +sports Europa League fixtures: Chi Pepe azọọla ndị Arsenal na ndagwurugwu ọnwụ Nicolas Pepe bụ onye ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ọjọo maka ihe ọ gbara na Premier League oge Arsenal zutere Sheffield United na ngwụcha izu a, abụrụla onye zọrọ ha. Goolu abụọ o nyere na nkeji 80 na 90, mere ka ọnwụ niile ndị Vitoria de Guimaraes na-eshi dị ka ebe e ji mmiri oyi wụnyụọ ọkụ. Marcus Edwards nke Vitoria de Guimaraes bu ụzọ sekpuwe Arsenal ala ka ha gbanyere goolu na nkeji asatọ e ji malite egwuregwu a n'ọgbọegwuregwu Emirates. Tupu Gabriel Martinelli asatara ndị Arsenal nke ha na nkeji 32 iji wepụ ha ihere n'ihu. Mana na-emeghị eme, Bruno Duarte gbakanyekwara goolu ọzọ na nkeji 36, iji gosi Arsenal na ha abụghịkwa mmọnwụ a na-akwa aka. Ọtụtụ ndị che na nke Arsenal na-eme agwụla oge e ruwere nkeji 80 mana ha asatabeghi goolu, mana Pepe e webatara n'ime nkeji 75 bịara zaa aha nna ya ma gbaa aka ahịa n'ime nkeji ahụ. Ka ọ dị ugbua, Arsenal ga-ezutekwa Vitoria n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba, mana ọ ga-abụ na be ha nke ugbua. Akụkọ ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50158928 +entertainment Onyeka Onwenu, Genevieve Nnaji, Linda Ikeji na ụmụada Imo state ndị ọzọ obodo Nigeria jiri biri "Ọ bụghị asị na ọtụtụ ụmụnwaanyị Imo steeti emetela ihe a ga-eji were ha na-etu ọnụ na Naịjirịa nakwa n'ụwa gbaa gburugburu. Ụmụnwaanyị ndị a egosila ihe mere ha ""dike"" n'ọgbọ e ji mara ha. Ọ bụ n'egwuregwu, ndọrọndọrọ ọchịchị, ime ejije, ka ọ bụ n'agụmakwụkwọ na ihe ndị ọzọ? Ha bụ anụ a na-agba egbe ọ na-ata ahịhịa. Lee ụmụnwanyị ndị BBC Igbo chọpụtara bụ ọkaibe n'Imo State: Onyeka Onwenu Onwenu bụ ""olu ogene"" nakwa agbara nwaanyị ma a bịa n'ihe gbasara ịgụ egwu. Dimkpa nwaanyị a bụ otiegwu, ọ rụburu dịka onye ntaakụkọ na BBC/NTA, ọ na-emekwa ejije na Nollywood kwa mgbe. O nwetala nturuugo dị icheiche maka ime ejije nakwa egwu ya. Kemafo Chikwe Chikwe rụburu dịka mịnịsta na-ahụ maka njem site n'afọ 1999 ruo 2001, nakwa nke na-ahụ maka njem ụgbọelu site n'afọ 2001 ruo 2003. Ọ rụkwara dịka onye ntaakụkọ nakwa onye nnọchiteanya Naịjirịa na mba Aịalandị. Ọ bụ odeakwụkwọ nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị nwere agba. A mụrụ ya n'ụbọchị 14 nke ọnwa Septemba, 1951. Chris Anyanwu Anyanwụ bụ onye ntaakụkọ nwere ụlọ mgbasaozi nke ya. Ọ rụkwaala dịka sinetọ n'ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa, ọ bụkwa odeakwụkwọ. Ihe o detara n'akwụkwọ mgbasaozi mere ka a tụọ ya nga mkpụrụ ọka site n'afọ 1995 ruo 1998, ma mee ka e nye ya nturuugo maka obiisiike ya. A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Ọktoba, 1951. Chinwe Norah Obaji Obaji arụọla dịka minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Naịjirịa. Ụmụakwụkwọ na-achọ ibanye mahadum na Naịjirịa kwesịrị ịma ya makana ọ bụ ya tinyere iwu e ji malite ile ule ndị mahadum a kpọrọ ""Post UME"". Eucharia Anunobi Anunobi bụ ome ejije a ma ama maka ime ejije ka ọ dịka ihe na-eme ezie. O meela ejije karịrị narị kemgbe o ji malite. A mụrụ ya n'ụbọchị 25 nke ọnwa Mee, 1965. Genevieve Nnaji A kọwa akụkọ maka ejije na Naịjirịa ma a kpọbeghị aha nwaanyị a Imo steeti ji eme ọnụ, aha e bidokwalanụ? Nnaji emeela ejije karịrị narị, ma nweta ihe nrite nakwa nturuugo karịrị iri. Ọ na-emepụtazị ejije nke ya ugbua, o mepụtara nke ndị ọnụ na-eru n'okwu na Hollywood zụụrụ. A mụrụ ya n'ụbọchị atọ nke ọnwa Mee, 1979. Rita Dominic Nwaturuocha Dominic bụkwa otu onye a na-asị ""ụnụ abịala"" n'ihe gbasara ime ejije na Nollywood. O meela ọtụtụ ejije karịrị narị, ma rite nturuugo karịrị iri. A mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Julaị, 1975. Linda Ikeji Ikeji bụ otu onye a na-akpụkarị n'ọnụ na Naịjiria ọkachasị ma a bịa n'ihe gbasara ide ihe n'ịntanetị nke Bekee kpọrọ ""Blogging"". Ọ nwere ụlọmgbasaozi nke ya, ��� bụkwa onye ọmepụrụ onye n'ihe gbasara ilekọta ụmụagbọghọ. O nwetala nturuugo ma na Naịjirịa ma na mba ofesi. A mụrụ ya n'ụbọchị 19 nke ọnwa Septemba, 1980. Perpetua Nkwocha E nwereike ichefu nwaanyị a n'ụwa egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa n'ụwa a? Ihe Nkwocha ji ụkwụ gbaa n'ụwa a, ""2 ekenwughi ya"". O so Naịjirịa gaa asọmpi Iko Mba Afrịka asaa, ma mabute iko ise n'ime ha. O nwetara nturuugo ""Nwaanyị kacha agba bọọlụ n'Afrịka"" ugboro anọ n'aka ndị Confederation of African Football (CAF). A mụrụ ya n'ụbọchị atọ nke ọnwa Jenụwarị 1976. Desire Oparanozie Oparanozie bụ akwaa a kwụrụ n'ihe e ji ụkwụ eme n'ọgbọegwuregwu. Ọ gbaala bọolụ n'ọtụtụ otu egwuregwu na mba ofesi kemgbe ọ malitere iji ịgba bọọlụ akpa ego. O sorola Naịjirịa gaa asọmpi Iko Mbaụwa atọ, nakwa Iko Mba Afrịka anọ ebe o buliri iko anọ ahụ. A mụrụ ya n'ụbọchị 17 nke ọnwa Disemba, 1993. Stephanie Okereke-Linus Okereke-Linus sokwa na ndị nwere agba na Nollywood. Ọ na-eme ejije, na-ede ejije, na-emepụtakwa nke mbiputa. O nwetala ọtụtụ nturuugo site n'ime ejije, ọ bụkwa ""Member of the Order of the Federal Republic, MFR"". A mụrụ ya n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba, 1982. Chioma Ajunwa Ihe Ajunwa mere n'egwuregwu Naịjirịa so n'ihe ndị mmadụ ga-akpụgide n'ọnụ n'ụwatụụwa. O ji ụkwụ wụtara Naịjirịa ọlaedo mbụ ya n'Olimpiks n'afọ 1996. O nwere nturuugo ""Member of the Order of Niger - MON"" A mụrụ ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Disemba, 1970. Betty Anyanwu-Akeredolu Ọ bụ onye na-akụ azụ na ụmụanụmanụ mmiri ndị ọzọ, ọ bụkwa omepụrụ onye. Makana ọ rịara ọrịa akpụ nke ara mana ọ taghị isi ya, o buzi ibuso ọrịa ahụ agha n'isi. A mụrụ ya n'ụbọchị 20 nke ọnwa Julaị, 1953. Munachi Abii Abii bụ ezigbote ""nwata makata mma"" nke gosiri oge o meriri n'asọmpi ""nwaanyị kacha maa mma"" n'afọ 2007. Ọ na-ede egwu, na-agụkwa agụ. Ọ bụkwa ihe Bekee kpọrọ ""model"". A mụrụ ya n'ụbọchị ise nke ọnwa Nọvemba, 1987. Chidinma Ekile A gụwa ụmụnwaanyị na-agụ egwu nwereike ime ka ị nyechaa ha ego i nwere n'ụlọakụ na Naịjirịa, Chidinma so n'ime ha. O nwetala ihe nrite ma gakwaa ọtụtụ mba dị iche iche site n'ịgụ egwu. A mụrụ ya n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Mee, 1991. Sandra Achums Achums so n'ụmụnwaanyị ""na-apụ ọkụ"" oge ọ na-eme ejije na Nollywood mgbe ndị dịka Dolly Unachukwu, Eucharia Anunobi na ndị ọzọ bụ ndị a na-achọ ka akara ọkụ. O mere ejije ruru 20 mgbe ahụ. A mụrụ ya n'ụbọchị 19 nke ọnwa Nọvemba, 1967. Lauritta Onye O riterela onwe ya na Naịjirịa ọlaedo abụọ site n'ịtụ ""shotput"". Ọ bụkwa onye na-eme ejije na Nollywood. A mụrụ ya n'ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị, 1984. Christy Opara-Thompson Opara na-awụ awụ, na-agba ọsọ. Ọ gbatara otu ọledo, otu ọlaọcha na otu ọlanchara n'ọsọ, ebe ọ wụtara otu ọlanchara oge ọ bụ ya. A mụrụ ya n'ụbọchị abụọ nke Mee, 1970. Flora Nwapa E nwereike ịgụpụta ndị odeakwụkwọ si Naịjirịa ghara ịkpọ aha Nwapa? Ọ dị egwu! Nwapa bụ 'a takata a gbọo' n'ide akwụkwọ, nke mere ka ụmmụnna ya chie ya Ogbuefi ma mee ka mbaụwa mara onye ọ bụ. Ọ rụkwara dịka onye nkuzi, minista na-ahụ maka ahụike nakwa mmekọrịta mmadụ na mmadụ, ma mechaa rụọ ka minista na-ahụ maka ala na mmepụta obodo. A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị, 1931, mana ọ nwụrụ n'ụbọchị 16 nke ọnwa Ọktoba, 1993. Priscilla Nzimiro N'agbanyeghị na ọ nwụrụ naanị ka otu afọ o ji gụchaa akwụkwọ o ji bụrụ dọkịta ahụike gachara, a ka na-echeta ya site n'ụlọakwụkwọ abụọ e hibere maka ya n'obodo ya bụ Ugwuta. Ọtụtụ ụmụnwaanyị ji maka ya banye ịgụ akwụkwọ maka ịbụ dọkịta ahụike. A mụrụ ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Epreelụ 1923, ọ nwụọ ụbọchị 22 nke ọnwa Maachị, 1950. Ụmụnwanyị ndị ọzọ Imo steeti ji aba mba gụnyere Viola Onwuliri bụbu mịnịsta maka agụmakwụkwọ, Daniella Okeke na-eme ejije na Nollywood, Catherine Acholonu bụ odeakwụkwọ a na-anụ aha ya oge ọ dị ndụ, Lesley Obiora Amede bụ ọkaiwu na mba Amerịka, na ndị ọzọ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49635516 +politics Russia and Ukraine conflict: Ihe ị kwesịrị ịma maka Volodymyr Zelensky ụwa kpụ n’ọnụ ugbua "Aha Zelensky bụ aha ụwa kpu n'ọnụ dịka Russia na-awakpoo mba Ukraine, kedụ ihe ima maka ya? Volodymyr Zelensky dị afọ 44 bụ onyeisiala mba Ukraine. O banyere n'oche ọchịchị mba n'ọnwa Mee nke afọ 2019. O mere ọtụtụ ihe ejije n'oge gara aga nke gụnyere ""Servant of the People"" nke mechara bụrụ aha pati o ji nwete mmeri na ntuliaka onyeisiala mba ahụ. Na mbido, Zelensky enweghi atụmatụ ịzọ ọkwa Onyeisiala ma fọdụzie inwete mmeri. Ugbua anya ụwa niile na-ele ya dịka ihe ọbụla o kwuru maọbụ mee nwereike ịsụnye ọkụ n'ọgbaghara nọ n'etiti mba Ukraine na mba Russia. Agwa ya egosila na ọ bụghịkwanụ mmanwụ a na-akwa aka dịka ọrụ ya ugbua gụnyere ịzụta obi ọtụtụ mba ndị ga-adọnyere ya ukwu n'oge agha na-ada, idaju ụjọ ji ndị mba ya nakwa ịchọ ụzọ ọ nwereike isi belata ihe a na-eme na mba Ukraine. A mụrụ Zelensky n'obodo Kryvyi Rih n'afọ 1978, nne na nna ya bụ ndị Juu nke bụ ya na onwe ya bụ onye Juu. Ọ natara ọzụzụ ịbụ onye ọkaiwu na mahadaum Kyiv National Economic University mana ọ hapụrụ ụzọ ahụ banye ụzọ ikpa ndị mmadụ ọchị. Mgbe ọ ka bụ nwaokorobịa, o sonyere mee ọtụtụ asọmpị ịkpa ọchị n'ihe onyoonyo nke mere ya ndị ogbo ya jiri mepee ụlọọrụ ebe a na-akpa ndị mmadụ ọchị na obi ọma akpọrọ Kvartal 95. Ụlọọrụ ya mere ọtụtụ ejije nke gụnyere ụfọdụ o meere ngalaba magbasazi nke 1 + 1. Ihor Kolomoisky bụ onye ọgaranye mba ahụ nwee ụlọọrụ 1 + 1 mechara bụrụ otu onye nwere agba kwadoro Zelensky na mmasị ya ịzọta ọkwa onyeisiala mba Ukraine n'afọ 2019. N'afọ 2014 mgbe ọgbaghara dapụtara na mba Ukraine, Zelensky ka nọ na-eme ejije. Otu ejije o mere mgbe ahụ mechara pụta n'afọ 2015 bụ ""Servant of the People"". Servant of the People mechakwara bụrụ aha otu pati ya nke pụtara ""Odibo ọha niile"" Ọgbaghara a so ọtụtụ ngagharịiwe dapụtara na mba ahụ mere a chutuo onye bụbu onyeisiala ha bụ Viktor Yanukovych n'ọkwa oche ya. Otu n'ime ihe ịkwesiri ima maka Yanukovych bụ na ọ kwadoro mba Russia. Mgbe a chuturu ya n'oche, Russia ji iwe jibodo mpaghara Crimea ma malite ikwado ndị otu na-achọ nwereonwe na mba Ukraine. Otu ndị a jupụtara n'Ọwụwa Anyanwụ mba ahụ. Ihe a so na ihe kpara ọgbaghara nọ n'etiti Ukraine na Russia ugbua. Cheta na Zelensky meriri Petro Poroshenko bụ onye bụbu onyeisiala mba ahụ na ntuliaka ma mecha bụrụ onyeisisala mba ahụ nke isii. N'oge achụmnta vootu, Petro Poroshenko kwara Zelensky emo nke ukwu ma kwuo na ọ gaghi achita aja n'ihi na ọ bụ onye na-akpa ndị mmadụ ọchị ma bụrụ onye na-enweghi ihe ọma banyere ndọrọndọrọ ọchịchị. N'oge achụmnta vootu maka ntuliaka ọkwa onyeisiala, Zelensky kwere nkwa na ọ ga-adaju ọgbaghara na-ada n'Ọwụwa Anyanwụ mba Ukraine. Mgbe ọ malitere ịchị, mbọ ndị ọgbara maka nke a mere ke ihe ruru mmadụ 14,000 nwụọ dịka ọtụtụ ọgbaghara dapụtara ebe ahụ. Na mbụ, ya na ndị isi mba Russia nwere mkparịtaụka kwa mgbe kwa mgbe banyere nkwado Russia na-enye ndị a. O bipụtara atụmatụ ikpe udo nke a kpọrọ ""Minsk agreements"" mana nke a achitaghi aja mancha. Onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin malitere inye ndị bi na mpaghara ahụ akwụkwọ njem nke mba ya nke bụ na ọ nabataghi mkpesa Minsk agreements. Mba abụọ a kpebiri ịkwụsị ibuso onwe ha agha n'ọnwa Julaị nke afọ 2020 mana obere esemokwu gara n'ihu dị n'etiti ha abụọ. Dịka mba abụọ nọ n'esemokwu, ihe gbara ọkpụrụkp tinyere ọkụ n'esemokwu nọ n'etiti ha ugbua bụ na Zelensky kwupụtara atụmatụ ya ibanye otu jịkọrọ ụfọdụ mba n'Europe akpọrọ North Atlantic Treaty Organization (Nato). Atụmatụ a bụ nke Russia akwadoghi n'ihi Onyeisiala Putin kwuru na Ukraine isonye Nato ga-emetụta nchekwa mba nke ya. Marakwa na Ukraine na Russia bụ ndị agbataobi. Ya bụ, ihe ọbụla Ukraine mere nwereike ịmetụta Russia. Ụjọ Putin bụ na Ukraine bụ enyị mba ndị ofesi na-abụghị ndị enyi ya dịka mba Amerịka, mba Briten, Mba France wdgz. Mba ndị Nato so na mba ndị ya na Putin anaghi akpakọ. Ugbua, Zelensky onye nọbụ na-eme ejije nakwa na-akpa ndị mmadụ ọchị site n'ihe onyoonyo abụrụla onye Russia na-awakpo mba ya maka mmasị ya isonye Nato." https://www.bbc.com/igbo/afirika-60548540 +sports Rangers International F.C.: 'Adị m naanị afọ 26 mgbe m duuru Rangers bute iko Federation ha ebubeghi kamgbe 1984' -Amobi Ezeaku Amobi Ezeaku bụ onye nchịkọta otu egwu bọọlụ Rangers dị naanị afọ 26 oge ọ malitere ọrụ a. A kpọrọ ya oge Rangers malitere inwe nsogbu ka o nye aka mana ụfọdụ mmadụ chere na ọ ga-aghị emeli ihe dị na ya maka afọ ole ọ dị. Mana ọ gara n'ihu bulatara ha iko dị icheiche n'afọ ise ya na ha nọrọ. Kirie etu o siri mee nke a. https://www.bbc.com/igbo/58575965 +entertainment Merry Christmas: Lee ihe ndị ị nwereike iji gbaara onwe gị ekeresimesi "I lezie anya nke ọma i nwereike ịhụ na ekeresimesi nke afọ a adabachaghị ka i si tụọ anya ya. Nke a mere na i nweghi ohere maọbụ ikike isonye ezinaụlọ gị, ndị enyi, ndị ikwu maọbụ ndị ibe gbaa ekeresimesi. Ka ọ ghara ịmapụ gị obi, n'ihi na i nwereike ịkpori ndụ naanị gị karịa mgbe gị na ndị ọzọ nọ. Ndị ọkachamara na-ahụ maka ahụike ụbụrụ tụnyere arọ etu i nwereike iji gbaa ekeresimesi a. O nwereike ị haziela ụzọ ị ga-eji gbaa ekeresimesi ka ọ tọọ gị gwogwo dịka ihe ị ga-eri, mmanya ị ga-aṅụ, onyinye a ga-enye gị gdz. Mana ebe ọ na-adabaghị etu ahụ, were obi ọma nabata ya ma chọọ ihe ọzọ were mee onwe gị obi ụtọ. Ọ bụ ụbọchị anụrị, e kwela ka ihe maọbụ mmadụ ọbụla mee gị obi ọjọọ. E tela n'ụra n'ụbọchị ekeresimesi na-amaghị ihe ị ga-eme, hazie onwe gị maka ihe ị ga-eri n'ụtụtụ, ehihie nakwa n'abalị. Gbaa mbọ hụ na i nwere nri dị mma ị ga-eri, o nwere ndị mmadụ i nwereike ịkpọ n'ekwentị ị kpọọ ha. I nwekwara ike chọọ ụlọ gị mma n'ụzọ pụrụiche, tinye foto ekeresimesi dị iche iche. Nke kachasị nke bụ chọọ ihe ị ga-eji mee onwe gị obi ụtọ. Ihe ọbụla ị maara na-enye gị obi ụtọ mee ya. O nwereike ịbụ ikiri onyonyo, ịgba egwu, ige egwu dgz. I nwereike zụọrọ onwe gị ihe onyinye maọbụ ihe ahụ na-agụ gị agụụ. A nọla na-eche ka mmadụ zụọrọ gị ya. Ọ bụrụ na o nwere ndị enyi gị ị chọrọ ịkwa okwu, chọọ ụzọ kpọọ ha n'ekwentị maọbụ ihe onyonyo. Maọbụ gị na ha ekirie ihe onyonyo. I nwekwara ike ikpagharịtụ maka ụkwụ ọzịza ma ọ bụrụ na ịnọ naanị agwụla gị ike. Ikwe ndị mmadụ ekele dị ka 'Merry Christmas' na-enye ezigbo aka. O nweghi iwu sị lekwa ụdị nri mmadụ kwesịrị iri n'ụbọchị ekeresimesi. Ọ bụrụ na ọ bụ akpụ, osikapa, ji, ede maọbụ agwa na-agụ gị, biko rie ya na-eleghị mmadụ anya n'ihu. Ọ bụrụ naanị ịta anụ ọkụkọ, nke ewu, nke ehi na-agụ gị, gbaa mbọ taa ya. Na nchịkọta, i nwereike ikpebi na ị gaghị agba ekeresimesi nke afọ a. Were ya ka ọ bụ ụbọchị ndị ọzọ n'afọ, nke ga-eme ka ọ dịrị gị mfe ichefu na ọ bụ ekeresimesi. Ihe kachasị mkpa bụ na i nwere obi ụtọ na ojuju afọ n'ime onwe gị. Maka na Igbo na-atụ ilu sị na ""anụ laa taa na echi bụ nta"", n'ụbọchị ntaa a chụọ n'owere nchi""." https://www.bbc.com/igbo/afirika-55432443 +politics Gummen attack: Ndị ọkaiwu Anambra steeti echerela Obiano aka mgba maka oke ogbugbu mmadụ na ntọ "Taa bụ Tuzde bụ abalị abụọ ndị otu jikọtara ndị ọkaiwu n'Anambra steeti bụ Nigeria Bar Association agbara abụbụ ọrụ maka ọnwụ onye otu ha ndị ntọ gburu izu gara aga. Odeakwụkwọ ndị otu ahụ n'Onicha bụ Frank Ibechukwu sị na ji ya bụ ohere zigara Gọọmentị steeti ahụ ozi ime ka ha kee ajị n'ume ma kwusinata oke ogbugbu mmadụ bụ nke na-arị ibe ya elu na steeti ahụ ugbua. Frank kwuru na ha buuru ngagharịiwe buga n'obi gọọmentị n'Awka bụ ebe odeakwụkwọ gọọmentị steeti ahụ bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu nabatara ha. Onyeisi ndị NBA niile bụ Steve Onyechi Ononye bụ onye kwuchitere ọnụ ndị ọkaiwu a chetere gọọmentị maka ntọ na ogbugbu onye otu ha Frank Onwuachi bụ onyeisioche ndị Omor dị n'Okpuruọchịchị Anyamelum izuụka gara aga. N'onu ya ""anyị gara ịhụ gọvanọ ka anyị mara ihe na-eme n'Anambra steeti gbasara oke ugbugbu mmadụ niile na-eme na steeti a; ma onye otu anye egburu ma ogbugbu ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na steti a"". Ndị okaiwu a sị na ha kwusiri ọrụ abalị atọ, site 21 ruo 23 nke ọnwa Maachi maka nkwanye ugwu ndị niile egburu egbu n'oge a na steeti ahụ. Onye otu ha so gaa ya bụ ngagharịiwe bụ Ogbonna ya Obasi sị na ndị ọrụ nchekwa ekweghị ka ha baa n'obi gọọmentị ga hu gọvanọ maka ya bụ mkpesa. Ọ sị ""anyị siri ọnwụ ị ga hụ Gọvanọ Willie Obiano mana ndị ọrụ nchekwa nọ na obi gọọmentị ahụ ekweghị ka anyị banye"". Cheta na izu gara aga na ndị amaghị ndị ha bụ gbagburu onye agha mmiri. Ọ mecheghị abalị abụọ a gbagbuo otu onye nche ndị nga na otu onye uweojii nwaanyị. Ka na-ekwu nke ahụ, ndị otu nzuzo gbuo otu nwantorobịa n'ihu nne ya buru isi ya laa n'okija." https://www.bbc.com/igbo/afirika-56500832 +entertainment Obi Cubana: Ihe mere akwamozu nne m ji dịka ebe a na-eme 'carnival' "Kemgbe akwamozu nne Obi Iyiegbu a ma dịka 'Obi Cubana', ihe ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ bụ kedụ etu nwa amadị a sị kpaa ego ericha ericha nke na ndị enyi ya tụkọtara ya ehi ruru narị atọ. Mana nwa afọ Ọba dị n'Anambra steeti akọwaala na ọ bụ aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ, na ya na ụmụnne ya tara ahụhụ tupu ha akpata ego. Na mgbarịtaụka ya na BBC Pidgin nwere ụbọchị Tuzde, Obi Cubana kwuru na ya chọjuru ọrụ afọ ka ya gụchara mahadum, ya ahụghị, tupu mbọ ya na-agba n' Abuja mepere ya ụzọ. 'Na mbido, a mụghị m n'ikpo ego' ""A mụrụ n'Ọba, Anambra steeti. Nne m bụ onye nkuzi. Ụlọakwụkwọ anyị, 'Central School Oba' chere ihu n'ebe a nọ kwaa nne anyị. ""E mechara gaa DMGS, Onicha .""E mechara gaa mahadum 'Unversity of Nigeria Nsukka' bụ ebe ọ ga -atụ gị n'anya na m gụrụ 'Political Science."" ""Anyị chọrọ ọrụ, chọọ ọrụ, akpụkpọụkwụ anyị kwọchacha, anyị bido rewe 'Mama put.'"" "" Anyị lekwara 'Beer Parlour'na Garden Abuja tupu El-Rufai bịa kụkpọ ihe niile. Anyị gbara aka mana mecha mepe Ibiza nke mụtara Cubana."" "" Oge anyị nọ na Garden, m̀ụ na ụmụ nane na ndị eji bi n'otu ọnụụlọ na Zone 4, Abuja. Ebe anyị na-atọgbọ matras n'ala nkịtị , mmadụ isi n'otu ọnụ ụlọ."" Ọ bụ ebe ka anyị nọ na-agba mbọ si ebe ahụ mụba mepe na Pọtakọt, Czechoslovakia, na Legọs. Mana ụfọdụ n'ime anyị kwechiri n'Abuja si n'ebe a ka anyị ka ga-ahụ isi ije anyị."" Obi Cubana nwere ụllọ oriri na nkwarị Bekee kpọrọ club'n'ebe dị iche iche na Naijiria nakwa mba dị ọzọ ma na-anọchitekwa anya mmanya Bekee dị oke ọnụ na Naijiria. Ewu na ọkụkọ gwụrụ n'ụlọ n'akwamozu nne Obi Cubana. Anaghị ekwuzị okwu ehi e jiri bịara ya akwamozu. ego e fere ebe ahụ dịka akwụkwọ ụkpaka dịka ndị enyi ya na ndị ihe ya na-amasị na-elu ya ego ma na-efekwa ndị ọbịa bịara n'akwamaozu nne ya. Iyiegbu kọwara ihe meere na akwamozu ya ghọrọ oriri na ọnụnụ kpọtụrụ akpọtụ. ""Ihe mere n'akwamozu nne m bụ na anyị kwere ya nkwa na ọ bụrụ na o rue afọ 80s, na anyị ga-emere ya mmemme pụrụ iche."" ""Mana ọ nwụọ tupu ọ gbaa ya bụ 80 anyị wee were ike anyị jibu a kwadoro ya mmemme ncheta ọmụmụ ya were kwaaa ya. Ya mere o ji dịka akụkọ ya ọ na-ewu ebe niile."" ""Enwere m anụrị n' ihe mere n'ihi na ọ bụ ihe ọma mere n'Ọba nakwa Anambara steeti. Ọ bụghị na e jidere m n' ebe m na-ezu ohi maọbụ na-emebi aha Naijiria."" ""Anyị amaghị na ya bụ akwamozi ga-ekworu etu ahụ. Ụmụnwoke niile ị hụrụ n'akwamozu a bụ ndị nnukwu mmadụ maara ihe ha na-eme n'achụmntaego maọbụ akaọrụ ha."" ""Kedụ ka m ga-esi agwa ha wụwa m ego? Ọ bụ ego ha, ọ bụghị m ga-agwa ha etu ọ ga-esi mee ego ha kpatara."" ""Ọ bụghị ego mere n'Ọba, ọ bụ obioma ndị mmadụ nwere ebe anyị nọ, ego mere n'Oba abụghị ihe ego nwere ike igoli."" ""Ego enweghị ike igoli ya. A nụghị akụkọ na awakporo nwaanyị, o nweghị onye e zuru ụgbọala ya."" ""Ihe ọ bụla ị na-eme e jila ndị mmadụ egwu egwu. Ọ bụ ndị m̀ụ na ha maara tupu a nụwa aha ezinaụlọ anyị mere ihe nile a ị na-ahụ."" Iyiegbu kwuru na ọ bụ onye na-agba mbọ, na-arịọkwa Chukwu amara , o nweta ngọzị. ""Ụkọchukwu agaghị enye gị ego n'ihi na ọ bụ ya ka ego kachasị dị mkpa. Dịbịa agaghị enyenwu ego n'ihi na ya onwe ya ụmụ ya na-echu mmiri n'iyi. ""O nweghị ncha a na m ebenye onye ọbụla, gbaa mbọ, na-ekpe ekpere , na-emeso mmadụ ibe gị obi ọma,Ngozi ga-ezute gị.""" https://www.bbc.com/igbo/afirika-57909590 +politics Liz Truss, Praịm Mịnịsta mba Briten agbaala arụkwaghị m "Praịm Mịnịsta ọhụrụ mba United Kingdom bụ Liz Truss, arịtuola n'ọkwa ọchịchị. Truss nọrọ naanị abalị iri anọ na ise n'ọkwa ọchịchị tupu ọ gbaa arụkwaghịm. Nke a mere ya Praịm Mịnịsta ọchịchị ya kacha dị nta na UK. ""Achọpụtala m na n'ihi etu ihe si kwụrụ ugbua, agaghị m enwe ike imezu ihe ndị m kwere na nkwa oge a họpụtara m dịka onyeisi otu 'Conservative Pati',"" Truss kwuru. ""N'ihi nke a, agwala m 'His Majesty' Eze na aga m aritu dịka onyeisi 'Conservative Pati."" A na-atụ anya na a ga-eme ntuliaka iji họpụta onye ndu ọhụrụ n'ime izuụka na-abịanụ, mana Truss ga-anọgid n'ọkwa ruo mgbe a ga-ahọpụta onye ga-anọchi ya. Liz Truss mere mgbasaozi n'ụbọchị Tọzde n'ihu ụlọọrụ Praịm Mịnịsta bụ 10 Downing 'Street'. O kwuru sị: ""Abatara m n'ọchịchị n'oge ọnọdụ akụnụba na-ama jijiji na mba ụwa dị icheiche."" ""Ezinụlọ na ụlọahịa dị icheiche nọ na nchekasị etu ha ga-esi kwụọ ụgwọ dị icheiche ha ji."" ""Agha ọjọọ Putin na-aluso Ukraine amajaala ọnọdụ nchekwa nke mpaghara Europe niile."" ""Ọnọdụ akụnụba na-anaghị eto eto dọghachiri mba anyị azụ nke ukwuu."" ""Pati Conservative họpụtara m dịka onye ndu ka m gbanwee ihe ndị a, anyị gbalịkwara n'ihe gbasara 'Energy', nakwa iwetu 'National Insurance'."" ""Anyị malitekwara atụmatụ ibutu ụtụisi ma mee ka ọnọdụ akụnụba gbalie, n'isoro nnwereonwe nke Brexit wetara."" ""Mana achọpụtala m na n'ihi etu ihe si kwụrụ ugbua, agaghị m enwe ike imezu ihe ndị m kwere na nkwa oge a họpụtara m dịka onyeisi otu 'Conservative Pati'."" ""N'ihi nke a, agwala m 'His Majesty' Eze na aga m aritu dịka onyeisi 'Conservative Pati."" ""N'ụtụtụ taa, mụ na onyeisi '1922 committee' bụ Sir Graham Brady nwere mkparịtaụka, ebe anyị nọ kwekọrịta na a ga-enwe ntuliaka iji họpụta onye ndu ọhụrụ n'ime izuụka na-abịanụ."" ""Nke a ga-eme ka anyị nọsie ike n'ụzọ iwulite ma kwadosie ọnọdụ akụnụba nakwa nchekwa obodo anyị ike."" ""Aga m na-arụ ọrụ dịka Praịm Mịnịsta ruo mgbe a ga-ahọpụta onye ọhụrụ ga-anọchi m."" Nsogbu bidoro oge Truss chụturu Kwasi Kwarteng, bụ Chancellor UK, n'ọkwa ya n'ihi ụfọdụ atụmatụ o tinyere nke mere ka ọnọdụ akụnụba mba ahụ kawanye njọ. Ka nke a mechara, ụfọdụ ndị omeiwu nọ na pati 'Conservative' gwara Truss ka ọ rituo n'ọkwa Praịm Mịnịsta n'ihi na ndị mmadụ enwekwaghị ntụkwasị obi n'atụmatụ ndị ọ na-ewepụta. Omeiwu Jill Mortimer so na ndị wepụtara akwụkwọ nkatọ ma kwuo na ya enweghị ntụkwasị obi n'ọchịchị Truss. N'ụbọchị Wenezde, enwere nrụrịtaụka kporo ọkụ n'ụlọ ọgbakọ ndị omeiwu dịka n'etiti Liz Truss na ndị pati Labour. Mana Truss kwechiiri na ọ gaghị aritu n'ọkwa. ""Abụ m dike ọgụ, abụghị m onye ụjọ ọgụ,"" Truss kwuru. Sir Keir Starmer bụ onyeisi otu Labour nke ụlọ omeiwu Briten kwuru na ihe ha chọrọ bụ ntuliaka ọhụrụ. ""Ọnyụpa ha (ndị pati Conservative) na-agba kamgbe afọ 12 gara aga apụtala ihe,"" Starmer kwuru n'ụbọchị Wenezde. ""Ndị mmadụ na-anwụ n'ihi na ụgbọala 'ambulance' enweghị ike iru ebe ha nọ n'oge."" ""Nde kwuru nde ndị mmadụ enweghịzi nri oriri maọbụ ekpomọkụ."" ""Ọ bụ na ihe ndị a ezubeghị iji mee ka ndị Tory mata na ha ba-ebute mba anyị ụzọ?"" ""Ụdị ihe a agaghị na-aga n'ihu. Britain agaghị aga n'ihu ịnabata ọdịda ndị pati Conservatives. Anyị chọrọ ntuliaka ọhụrụ ugbua.""" https://www.bbc.com/igbo/articles/cx8w3zddn55o +sports Nigeria UFC: Etu m si bụrụ ọkaibe n'ịlụ ọgụ 'Martial arts' ka awụchara m 'acid' - Lovethpatra Young LovethPatra Young abụrụla ọkaibe n'ọgụ Martial art na mba United States dịka awụchara ya 'acid' otu mgbe. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, LovethPatra Young kọọrọ etu esi gbahapụ ya tupu ọ bụrụ ugo na-achakezi ma n'ofesi. Akụko ya ga-akpalite mmụọ gị. Gere ya n'uju ebe a: Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Chiemela Peter https://www.bbc.com/igbo/media-55794726 +business Forbes: Dangote kachasị, Adenuga na-eso ya na ngụkọ onye ka nwe ego n'Afrika "Akụkọ dị mkpa: Dịka ngụkọ akwụkwọ akụkọ Forbes siri gosi, Dangote bụ onye kachasị nwee ego n'Afrịka dịka o nwere ihe ruru ijeri dọla iri na ụma ($10.3b). Ebe onye na-eso ya bụ Mike Adenuga, onye nwere ijeri dọla itoolu na ụma. Mana Dangote ji ijeri dọla abụọ gbatuo n'ihe ọ dara n'afọ gara aga, n'ihi ọnụ Dangote Cement n'ahịa ego Naijiria dara ada, mana Mike Adenuga si na ijeri dọla ise ọ dara n'afọ gara aga gbalite ihe ọ dara. 3. Nicky Oppenheimer - $7.3 billion 4. Nassef Sawiris - $6.3 billion 5. Johann Rupert - $5.3 billion 6. Issad Rebrab- $3.7billion 7. Nagruib Sawiris $2.29 Billion 8. Koos Bekker $2.3 billion 8. Isabel dos Santos $2.3 billion 8.Strive Masiyiwa $2.3 billion 8. Patrice Motsepe $2.3 billion Akụkọ kpọtụrụ ụbọchị Wenezde bụ alụmdịnanwunye mere n'etiti otiegwu Adekunle Kosoko a ma ama dịka Adekunle Gold, nakwa ogbo ya bụ Simisola Bolatito Ogunleye, onye ama dịka Simi. Adekunle Gold na Simi mere alumdinanwunye nzuzo ebe ha kpọrọ naanị ndị enyi ha mmadụ narị atọ oku gụnyere ndị ama ama na Naijiria. E ji egwu, ""Sade"" nakwa ""Orente"" mara Adekunle Gold, ebe e ji ""Jamb Question"" na ""Love Don't Care"" mara Simi. Ozi pụtara bụ na ndị egwu abụọ a hiwere ụbọchị agbamakwụkwọ ha n'otu ụlọoriri dị na Victoria Island, Legos ebe ha kpọrọ naanị mmadụ narị atọ bịa soro ha nụrịa. Akụkọ alumdinanwunye ha kpanyere ọkụ na soshal midia. Ụfọdụ na-ekwu na alumdinanwunye ha ga-agbawa Falz, onye ọzọ na-eti egwu, obi. Falz n'onwe ya tinyere foto nwata anyammiri na-apụ n'anya n'igwe ogwu Twitter ya dịka akụkọ ahụ na-ewu. Ndị mmadụ na-esi imi n'ala ịhụta foto maọbụ onyonyo ihe mere n'emume ahụ. Ndị ihe ha na-amasị dịka @ịamogpaschal na-ekwu na o meghị ha na mberede n'ihi na ha matara na o nwere ihe na-aga n'etiti ha. #Amaechitapes Gọọmentị etiti ekwuola na iwepụta ihe e kwuru bụ olu Rotimi Amaechi bụ minista na-ahụ maka njem, ebe ọ na-akatọ gọọmentị, agaghị ebute ọgbaghara n'etiti ndị APC. Ebe ndị otu na-ahụ maka ndị ọrụ na Naịjirịa na gọọmentị etiti enweela nkwekọrịta na Onyeisiala Buhari ga-ezigara ndị ụlọomeiwu akwụkwọ ha ga-etinye n'iwu, nke ga-eme ka a malite ịkwụ puku naịra iri atọ dịka ụgwọ opekatampe, n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke Jenụwarị a. N'akụkọ ọzọ, Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ekwuola na ọ ga-adị mma iwepụta iwu ga-achịkwa igwe okwu soshal midia iji beleta nsogbu akụkọ ụgha. Osinbajo onye kwuru nke a n'ọgbakọ akụkọ ụgha nke BBC hiwere n'Abuja n'ụbọchị Wednesde kwuru, ""ọ bụrụ na o nweghị ihe e mere gbasara akụkọ ụgha, o nweghịzị ihe a ga-ekweta na ọ bụ eziokwu n'obodo Naịjirịa."" Ngalaba na-ahụ maka ule ịbanye mahadum bụ Jamb enyela iwu na ụmụakwụkwọ nwere nsogbu banyere ihe e jiri mara onye nke a kpọrọ biometric data' ga-eme ule nke ha n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja. Ọnụ na-ekwuru ndị Jamb bụ Fabian Benjamin kwuru na nke a bụ iji gbochie ndị ji aghọghọ na-ekwu na ha enweghị nwụ ike idebanye aha ha iji nwe ohere iti mkpu ka e higharia ule nke ha. N'ofesi, Ụlọọrụ Kọmishiona mgbasaozi nke mba Briten adaala ụlọọrụ Cambrige Analytical nha maka kpụ ụkwụ n'ala na'ịkwụ nha puku paụnds iri na ise maka ịda iwu ichekwa akara ndị mmadụ (data protection Act. Ebee ka Victor Moses kwụ akwụ? Dịka ọgba bọọlụ Naijiria bụ Victor Moses gara ezumuike site n'ịgba bọọlụ mba ụwa, ọnọdụ ya edozighị anya dịka o nwere ike ịhapụ otu Chelsea. Moses gbara Chelsea ofuma na afo bọọlụ abụọ gara aga oge Antonio Conte na-achịkọta Chelsea. Mana n'afọ ọhụrụ a, ọ pụtara naanị ugboro abụọ n'ime asọmpi iri abụọ na otu nke premier league,dịka onye nchịkọta ha ugbua bụ Maurizio Sarri, sị na ya amaghị ije ya. Ndị agha Naịjirịa atọghapụla onye ntaakụkọ Daily Trust bụ Uthman Abubakar, ha nwụchiri n'ụlọọrụ ha na Maiduguri, mana ọ ka fọrọ. Onyeisi ụlọọrụ Daily Trust bụ Mannir Dan-Ali, kwuru na ndị agha ka ji ekwentị Abubakar nakwa kọmputa ya. N'ofesi, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ka na-ebe akwa ego o ji arụ mgbidi ahụ aja ọ chọrọ iji egbochi ndị mbịarambịara ịbata na mba ya. N'ihe bụ okwu mbụ ọ na-agwa ndị mba ya n'ihe nkiri n'afọ a, Trump kwuru na a ga-esi n'ihe a kpọrọ North American Free Trade Agreement kwụọ ụgwọ mgbidi a. N'egwuregwu, Mohamed Salah nke Ijipt atụrụla ugo dịka ọkaibe n'egwu bọọlụ Afrịka. Ebe otu egwu ụmụnwaanyị Naịjirịa zọrọ Naịjirịa ihu site n'inweta nturu ugo mba bụ ọkaibe n'Afrịka na nturugo CAF. Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji Ihe nkiri ga-amasị gị Chukwuemeka Afigbo na-arụ na Facebook chọrọ ka ị mụta etu esi abụ ọkaibe n'ihe gbasara teknụzụ." https://www.bbc.com/igbo/afirika-46798616 +politics APGA Primaries: Soludo emeriela na ntuliaka imeụlọ otu APGA "Ọkammụta Charles Soludo emeriela na ntuliaka imeụlọ otu APGA mere maka ọkwa gọvanọ Anambara steeti aga eme n'ọnwa Novemba afọ 2021. Soludo , onye bụbụ onyeisi ụlọakụ etiti ji vootu dị 740 n'ime 792 mere Ichie Ezenwankwo bụ onye nwetara vootu 41 na ntuliaka ahụ e mere n'Ọka ụbọchị Wednezde. Ndị ọzọ so zọọ ntuliaka imeụlọ ahụ bụ Damian Okolo nwetara vootu asaa, ebe Thankgod Ibeh nwetara vootu anọ. Awka na-ekpobu ọkụ n'ụtụtụ ụbọchị Wenezde dịka ntụliaka imeụlọ nke otu APGA na-aga n'ihu n'ọgbọ egwuregwu Alex Ekwueme. Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ kwuru na ọ hụrụ ndị ọrụ nchekwa juru ebe ahụ ma dịrị njikere ịchekwa udo maka ọgbaghara ọbụla ga-adapụta. BBC ghọtakwara na Chukwuma Soludo so na ndị na-azọ ọkwa ahụ nakwa onye bubu onyeisi otu ahụ bụ Victor Umeh nọ ebe ahụ ugbua. A ga-ebu ụzọ nyochaa ndị nọ ebe ahụ n'atụmatụ a kpọrọ ""Accreditation"" tupu ha gaa tụọ vootu na Dora Akunyili Development Centre dị n'ụzọ Awka - Enugwu. Nkwado ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra steeti ebirila ọkụ ugbua dịka ụda ya na-ada n'otu All Progressive Grand Alliance bụ APGA. Dịka ụfọdụ akụkọ na-efegharị si kwuo, ngalaba Independent National Electoral Commision na-elekọta ntụliaka wepụrụ APGA na ndị ga-eso wepụta onye ga-azọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti. Akwụkwọ edemede BBC Igbo hụrụ anya kwukwara na otu APGA ahụ emeghi ka ha si kwesi n'ịgwa Inec maka ntụliaka imeụlọ ha na-akwado ịme tupuu ha emee ya. N'ime edemede ọzọ BBC Igbo hụrụ anya, Inec na-adọ otu ahụ aka na ntị maka aha ndị ga-azọ ọkọlọtọ ha nke ha wegaara n'ụlọọrụ INEC. Ha kwuru sị ""o doghi anyị anya na nhọpụta aha ndị a soro usoro ọchịchị onye kwuo uche ya..."" Jude Okeke bụ onye si n'otu ahụ dọbiri na-ebo Victor Oye bụ onyeisi otu ahụ ebubo na ọ ma ụma na-achọ ịwepụ APGA n'otu ndị ga-eso zọọ ọkwa Gọvanọ ahụ. Mana Oye gwara BBC n'ozi ekwentị na o nweghi nsogbu ọbụla dị n'otu ha. ""E nwero nsogbu ọbụla na APGA. APGA kwụ chịm chịm na-agbanyeghi atumatụ ọjọọ ndị iro anyị."" Ọzọ Oye kwuru ""E jim ohere a akpọ ndị otu anyị niile ka ha gbaa mbọ jịkọta aka ọnụ ka anyị kwado APGA maka ọdị mma Naịjirịa, ọ kachasị Anambra steeti"" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-57569531 +religion Nigerian pastors: Ụkọchukwu ndị 'na-eti eti' n'ọwụwa-anyanwụ "Ụfọdụ ndị ụkọchukwu na Naịjirịa bụ ndị a na-ahụta dịka ndị ""ma nke ha riri"" ma a bịa n'ịta akụnaụba. Ndị ụkọchukwu a, ganye ndị nke ụlọụka ha dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ, bụ ndị hibere ụlọụka nke ha, ma nwee ọtụtụ ndị na-abịa efe ofufe ebe ahụ. Ọtụtụ ndị na-aga n'ụlọụka ha bụ ndị ọ ga-abụ a sị ha ""wụlie elu"" ha asị ""kedụ ogo ị chọrọ ka anyị wụruo?"" Nke a kpatara ọtụtụ ndị mmadụ si eche na ndị a na-aga ụka ha anaghị ahụ ihe ọjọọ ọbụla n'ime ibunye ndị ụkọchukwu a ego ọbụla ha nwere ka ha na-ebi ndị ọma, ebe ha na-ata ahụhụ. Lee ụfọdụ n'ime ndị ụkọchukwu ahụ na etu ha si wuo maka ịta akụ. 1) Intercessor Jehovah: Onye a bụ onye amụma na-ewu ewu n'Aba, Abịa steeti maka ihe ọ na-eme n'ụlọụka ya bụ ""Holy Ghost searchlight and deliverance ministry"". E ji onye na-ebibi mmụọ ọjọọ a kpọrọ ""demon destroyer"" mara ya. Ọ bụ otu nwoke ma ka e si ata akụ n'ụzọ gụnyere ịzụ ụgbọala bụ ""elelebe ejeghi ọrụ"", dịka ndị ụlọụka ya tinyere na soshal midia, nke ọ zụrụ ọhụrụ n'ọnwa Maachị a mere ya Hummer Limousine stretch nke atọ ọ na-azụta. 2) Onye amụma Chukwuemeka Ohanaemere: Onye amụma a ama dịka Odumejeje, bụ onye hibere ụlọụka ọ kpọrọ ""Mountain Of Holy Ghost Intervention And Deliverance Ministry"", dị n'Ọnicha, Anambara steeti. Ọ bụ otu onye ndị mmadụ na-akpụkarị n'ọnụ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ maka etu o si agbasa aka n'ihe banyere akụnaụba. Ụfọdụ oge ka a hụrụ ya ebe ọ na-abọnye ego n'elu ọdọmmiri, oge ọzọ ka a hụrụ ya ebe ọ na-abọ otu onye Nollywood ego. 3) Onye amụma Ebelenna Chukwu Ebelenna bụ onye ọzọ na-ewu ewu n'ala Ọnịcha, Anambara steeti. Ọ bụ onye hibere ụlọụka a ma dịka ""Jehovah The Mightier Than All Prophetic Church"". A hụla ya n'ihe nkiri ebe ọ nọ na-efe nnukwu ego ka otu onye ụlọụka ya na-agba nkwụ. N'ihe onyonyo ahụ, otu onye bu akpati ego na-esogharị ya ka ọ na-abọ ya bụ ego." https://www.bbc.com/igbo/afirika-47616017 +business CBN eyiharịala ma bulie ịdọrọ ego ATM site N100,000 ruo N500,000 "Akwụkwọ ozi na-ekwu na ụlọakụ kachasị na Naijirịa bụ Central Bank of Nigeria ebuliela ọnụ ọgụgụ ego mmadụ nwereike ịwere kwa izuụka n’igwe ATM site n’otu puku narị naịra ruo puku narị naịra ise ebe ụlọọrụ agaghị abụzị puku narị naịra ise ma bụrụzịa nde naịra ise. Ha kwuru na ha mere mgbanwe a dịka ndị mmadụ tụnyere uche ha maka atụmatụ iwetu ego e nwereike ịdọrọ n’igwe ATM kwa izuụka. Akwụkwọ ozi a kwuru na ọ bụrụ na ego mmadụ chọrọ iwere karịrị dịka ha siri kwuo, na onye ahụ ga-akwụ 3% n’ime ego ọ chọrọ iwere ebe ụlọọrụ ga-akwụ 5% n’ime ego ha chọrọ iwe. Ọzọ kwa a bụrụ na ụlọakụ ga-anata onye ahụ: 1)      Akwụkwọ njirimara onye ahụ ( National ID card, International Passport, Drivers License) 2)      Akara Bank Verification Number onye a na-enye ego 3)      Tax Identification Number onye na-akwụ na onye a na-enye ego a. 4)      Akwụkwọ ikike nke si n’aka onyeisi ụlọakụ e si ewewre ego a. Akwụkwọ ozi a kwuru na atụmatụ ọhụrụ ga-adị ire site n’ụbọchụ itolu nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023 ma sịkwa na ọ ga-akagbu atụmatụ ego nke ha hiwere n’ụbọchị 6 nke ọnwa Disemba afọ 2022. Dịka Ụlọakụ Etiti nke Naịjirịa wepụtara iwu ọhụrụ gbasara etu ndị mmadụ si adọrọ ego n'ụlọakụ, ọtụtụ ndị mmadụ atamuola ntamu n'ihi mgbagwojuanya etu ya bụ iwu ga-esi metụta ha. Cheta na iwu ọhụrụ a CBN tinyere ga-amalite ịdị ire n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Jenụwari 2023. Otu n'ime iwu ọhụrụ a bụ na mmadụ agaghị enwe ike ịdọrọ ego karịrị 20,000 naịra site n'igwe ATM maọbụ POS n'otu ụbọchị. Onye ọ bụla mere nke a ga-akwụrịrị 1000 naịra maka 20,000 ọbụla, nke pụtara 5%. Iwu a kwukwara na akwụkwọ ego ndị ụlọakụ ga na-etinye n'igwe ATM agaghị agafe akwụkwọ narị naịra abụọ. Ndị ọkachamara gbasara okwu akụnụba nakwa ego etinyela ọnụ iji kọwaa uru nakwa ọghọm ga-esi n'iwu ọhụrụ a pụta. Katch Ononuju bụ ọkachamara n'okwu akụnụba gwara BBC Igbo na iwu ọhụrụ a CBN wepụtara bụ ọrụ ha ka ha na-arụ. O kwuru na ọ bụ ihe dịịrị CBN ihazi etu e si ejikwa ego na Naịjirịa. Dịka Ononuju si kọwaa uru iwu ọhụrụ a ga-aba gụnyere: Ononuju kwuru na onweghị ihe ọbụla n'ụwa dizu mma, kama ọ bụ dịka oge na-aga, ndị mmadụ ga na-amụtawanye ụzọ ka mma isi eme ihe dị icheiche. Ọ kọwara na ọ bụ eziokwu na akụrụngwa tekịnụzụ e ji ezipu ma na-anabata ego anaghị arụcha ọrụ nke ọma na Naịjirịa mana iwu ọhụrụ a ga-eme ka ndị ụlọakụ lebaa anya n'akụrụngwa ha ma mee ka ọ kawanye mma. N'okwu nke ya, Okechukwu Okere bụ ọkammụta na ngalaba 'Economics' kwuru na mbọ CBN na-agba ibelata etu ego si esi n'aka fere n'aka na Naịjirịa bụ ihe dị mma. Nke a bụ maka na nrụrụaka na-aka mfe ime site n'iji ego a hụrụ anya karịa iji tekịnụzụ ezipu maọbụ anabata ego. Iji akụrụngwa tekịnụzụ ezipu maọbụ anabata ego bụkwa njirimara obodo meperela emepe, Okere kwuru. Mana mperi dị n'iwu ọhụrụ a bụ na akụrụngwa teknụzụ kwesịrị ime ka nzipu na nnabata ego dịwanye mfe, anaghị arụ ọrụ nke ọma na Naịjirịa. Iji maa atụ, Dkt Okere kwuru na ọtụtụ oge ka mmadụ ne-ezipu ego site n'ekwentị ya, ego ahụ apụọ n'ọbaego ya, mana onye o zigaara ego agaghị enweta ya. Ọzọkwa bụ na ị gaa n'ọtụtụ ime obodo na Naịjirịa, ịntaneetị adịchagị maọbụ ike ha agagghị ebuli nzipu na nnabata ego dịka ọ dị n'obodo ndị mepere emepe. ""Ihe ndị a ka gọọmentị kwesịrị ibu uzo tinye anya, mee ka ha na-arụ ọrụ otu o kwesịrị tupu etinyezie iwu dị otu a,"" Dkt Okere kwuru. ""Maka na dịka ọ dị ugbua, ihe iwu a ga-eme bụ ime ka ihe siwanyere ọtụtụ ndị Naịjirịa ike."" Iwu ọhụrụ ndị a gụnyere; Iwu ọhụrụ a ga-amalite rụwa ọrụ n’ụbọchị 9 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023. CBN sị na ha mere nke na mbọ ha na-agba n’ime ka naịra sie ike bụkwa nke ha malitere site n’ịgbanwe ihu ego narị abụọ, narị ise na otu puku naịra (N200, N500 na N1000). Chet na ụlọakụ etiti site na nkwado Onyeisiala Muhammadu Buhari gbanwere ihu ego ndị a n’ọnwa Nọvemba 23, 2022." https://www.bbc.com/igbo/articles/c99gx19gn4zo +entertainment Lee nwaanyị na-amara Chukwu mbem na ka o si ama ya "Ify Nweke bụ nwaada Igbo nwere onyinye ịma mbem. Ọ sị na anaghị agara ịma mbem ụlọakwụkwọ na ọ bụ sọ Chi na-enye mbem. Ify si na nwata mawa mbem. Ọ na-akọwa na mbem bụ onyinye nke mmụọ ya ji arịọ Chukwu ihe dị ya mkpa. ""Ọnwebeghị ihe m ji mbe a rịọ Chukwu ọ mebeghịrị m ya"". Ify sị na mgbe ya rịara ọrịa na ọ bụ mbem a ka ya jị chọta ihu Chukwu gwọrọ ya bụ ọrịa. Ọ sị na isi mbem bụ n'egwu ka ọ dị. Ify sị na ọnye onyinye mba mara wepụta ya, ""ezozina ya ezo, ka anyị were ya na-enye Chineke otito"". Mbem bụ ụsoro agụmegwu pụrụiche. Ọ nye na-ama mbe ji okwu agụ egwu. Ihe a ga-eji tụnyere ya na Bekee bụ ""rap music"" nke ọtụtụ ụmụntorobịa na-eme taa. Mbem bụ ọdịnala nka ndị Igbo ja ji eme ihe siri ike. A na-eji mbam eto jike, eji ya akwa arịrị ma ihe ike mee n'obodo. Ejikwa ya akpọkụ olisa dị n'igwe ma ọ dị na mkpa. Onyinye mbem na-ama mmadụ ama, anaghị amụ ya amụ. Ụmụnwoke na-amakarị mbem, mana lekwa nwaanyị a Chukwu nyere onyinye mbem. Igbo bụ ndị na-ekwupụta etu ihe dị ha n'obi. Lee ihe ndị mere mbem jiri dị mkpa n'ala Igbo - Ọ bụ Chigozie Ohaka na Chiemela Mgbeahuru mere akụkọ a" https://www.bbc.com/igbo/60101099 +sports Africa Games 2019: Ụmụ Igbo kpokọtara ọla n'asọmpi Ụmụ Igbo gosiri na ha bụ atakata a gbọọ dịka ha so kpokọọ ọla dị iche iche n'asọmpi Africa Games e mere na mba Moroko n'ọnwa Ọgọstụ 2019. Igbo nwere mmadụ n'ezie. Nke a gosiri onwe ya n'asọmpi a, dịka ha nọ na-atụtụ ọla n'akanri na akaekpe. Naịjirịa nwetara mkpokọta ihe nrite 127 n'asọmpi a, mana lee ndị Igbo so tụkọta ihe nrite ndị ahụ. Eze Joy Ogbonne Ogbonne a mụrụ ụbọchị isii nke ọnwa Juun 2004, gara asọmpi ahụ bụrụ 'agụ'. Nwaada a kpokọtara ọlaedo atọ. Ọ bụ onye Ebonyi steeti. Amalaha Joy Chika Amalaha a mụrụ ụbọchị 28 nke ọnwa Ọktoba 1997, ji aka na-ekpokọ ọla n'asọmpi ibuli igwe e ji akpụ ụzụ. O nwetara otu ọlaedo na ọlaọcha abụọ na nke afọ 2019 a. N'afọ 2014, o nwetara ihe nrite ọlaedo n'asọmpi Commonwealth, mana a napụrụ ya mmeri ahụ makana a chọtara 'ọgwụ ike' n'ahụ ya. Ọ bụ onye Abịa steeti. Kalu King Kalu a mụrụ ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba 1995, tụtụchara ọla atọ a na-enye n'asọmpi ibuli igwe. O nwetara otu ọlaedo, otu ọlaọcha na otu ọlanchara. Ọ nọchitekwara anya Naịjirịa n'asọmpi Commonwealth nke afọ 2014. Eke Uche Devon Eke a mụrụ ụbọchị 12 nke ọnwa Ọgọstụ 1997, nwetara ọla abụọ n'imegharị na ịgbatị ahụ nke a kpọrọ 'Gymnastics'. O nwetara otu ọlaedo na otu ọlanchara. Ọ bụ onye Amaukwu, Imo steeti a mụrụ na mba Amerịka. Akano Desmond Akano a mụrụ ụbọchị 30 nke ọnwa Septemba 1997, nwetara ihe nrite abụọ n'asọmpi ibuli igwe. O nwetara ọlaọcha abụọ. Ọ bụ onye Imo steeti. Nwaokolo Augustina Nkem Nwaokolo a mụrụ ụbọchị 12 nke ọnwa Disemba 1992, nwetara ihe nrite atọ n'asọmpi ibuli igwe. O nwetara ọlanchara atọ. O ritekwara ọlaedo n'asọmpi Commonwealth nke afọ 2010. Ukeh Uchechukwu Deborah Ukeh a mụrụ ụbọchị 12 nke ọnwa Nọvemba 1996, nwetara ihe nrite abụọ n'asọmpi 'Badminton'. O nwetara otu ọlaedo na otu ọlaọcha. Ọlaọcha ya bụ nke ya na Dorcas Adesokan so pịata. Ndị a niile bụ ndị nwetara ihe nrite karịrị otu. Ndị Igbo ndị ọzọ sokwa nweta ihe nrite dịka n'ọsọ, bọọlụ nakwa egwuregwu ndị ọzọ. Akụkọ ndị a ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49541414 +health Cancer prevention: Ihe ndị i kwesịrị ịma maka ọrịa kansa - Ndị ọkachamara Dkta Chukwumere Nwogu na Oge Iloegbunam bụ ndị ọkammụta n'ihe gbasara ọrịa kansa kọwara BBC Igbo maka ọrịa a na-etu e si egbochi ya iwere ndụ mmadụ. Na nkọwa ha, ụfọdụ ndị mmadụ na-egboji ọrịa kansa,mgbe ha ga-eji gazie ụlọọgwụ ọ bụrụ na ọ gbasasịala n'akụkọ ahụ ha. Nke a, dịka ka ha siri kwuo, nwere ike ime ọgwụgwọ e sie ike, mekwa ka ọ dị oke ọnụ. https://www.bbc.com/igbo/afirika-48148161 +business Abia State: Ụkọ bread emeela anyị ịwa n'Aba "Dịka achịcha Bekee 'bread' kọrọ ụkọ n'Abia steeti abalị olemole gara aga, ụfọdụ ndị bi na steeti ahụ akọọla etu ha na ihe si eme. Ndị ụlọọrụ na-emepụta bureedi arụbeghị ọrụ ụbọchị olemole nke mere na ndị mmadụ ahụghị nke ha ga-azụ. Chima Akudike, onye bi n'Aba gwara BBC Igbo na ya bụ ihe adịghịrị ọtụtụ ndị mmadụ mfe. O kwuru sị: ""Ọtụtụ ndị mmadụ bụ bureedi na mmanya ọtọ bịrịbịrị ka ha ji eme nri ụtụtụ."" ""Tulegodi ihe ndị dị otu a ga-emezi ugbu a."" Dịka Akudike si kwuo, ụlọahịa niile dị n'okirikiri ebeo bi enwebeghị bureedi ruo n'ụtụtụ ụbọchị Tuzde. Ọ kọwara na ọ bụ abụbụ ọrụ ka ụlọọrụ na-emepụta bureedi gbara n'ihi na ha kwuru na ọnụahịa ntụ e ji eme achịchị nke bekee kpọrọ 'flour' arịala elu nke ukwu. Mana onye ọzọ bi n'Aba gwara BBC Igbo na ndị bureedi amalitela ire obere obere n'okirikiri nke ya. Otu jikọtara ndị na-eme bụredị n'Abịa steeti bụ otu a kpọrọ 'Master Bakers' na Bekee. Onyeisi ha bụ Emma Nwaohia gwara ndị ntaakụkọ na ha chọrọ ịme nzacha ma mkpocha iji kwadoo ịmalite ọrụ n'uju kemgbe akpọghechara obodo ọzọ maka ọrịa coronavirus. Nwaohia kwuru na ọ bụ ya kpatara ha ji wụsaa ọwa kemgbe otu izuụka gara aga. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị otu 'Master Bakers' ga-eji ohere ahụ tịnye anya n'ihe ụfọdụ na-akpa ha. Nwaohia kwuru na agha coronavirus a mekpara ha ahụ nke ukwuu nke mere ọnụahịa ihe niile ha ji eme bụredị ji rịchaa elu ọjị. O kwuru na kemgbe Maachi, na ihe niile e ji eme bụredị dịka flọọ, shụga, bụta na ndị ọzọ arịala elu ugboro ise karịa. BBC Igbo na-agba mbọ inweta Nwaohia ka ọ kọwaara anyị ihe na-emenụ n'uju. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-53734616 +politics 'Nnamdi Kanu na-etinye ndụ ndị otu 'Eastern Security Network' na nnukwu nsogbu' Ralph Uwazuruike bụ onyeisi otu Movement for the Actualisation of the Soverign State of Biafra, MASSOB ekwuola na ọ bụ ndụ ụmụntoroọbịa ka o na-tinye na nsogbu site n'ihibe Eastern Security Network. O kwuru na otu Ipob bụ nke a machịrị amachịrị ya mere na onweghị ihe ha mepụtara a ga-anabata. N'okwu ya, ekwesiri katọọ atụmaatụ ya makana o zighị ezi. https://www.bbc.com/igbo/afirika-55292430 +politics Ụlọikpe akwadola ndị sineti na ọjụjụ Magu Ulọikpe ukwuu dị na Abuja ekwetala na ndị sinetị Naijiria mere ọfụma ijụ Ibrahim Magu dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka ibuso mpụ na nrụrụaka agha a kpọrọ EFCC. Onyeisi ala Naijiria bụ Muhammadụ Buhari họpụtara Magu ịbụ onyeisi EFCC ugboro abụọ mana ndị sineti jụrụ ya ugboro abụọ. Dịka nkachi a si ga, ọkaikpe ukwu a kpọrọ John Tsoho kachiri na EFCC echeghị ọfụma mgbe ha na-eche na ndi sineti ga nabatarịrị nanị onye ndị isi ọchịchị họpụtara. Tsoho kwuru na sineti nwere ikike i mgba mbọ hụ na sọsọ ndị tozuru etozu ka a ga họpụta maka ọrụ onyeisi ngalaba n'ahụ maka ibuso mpụ na nrụrụaka na Naijirịa. https://www.bbc.com/igbo/42908213 +religion Kedụ ndị bu ụzọ tụgharịa 'Bible' n'asụsụ Igbo? "Okwukwe ndị ofufe nke Kraịst bụ n'akwụkwọ nsọ ka o hiwere. Nd�� Igbo nwere akwụkwọ nsọ nke e dere n'asụsụ Igbo ha na-eji aka ụka mgbe ọbụla ha zụgọrọ maka nkea. Kama ọtụtụ ndị mmadụ mamaghị ọnye tụgharịri ya bu akwukwọ nsọ n'asụsụ Igbo. Akụkọ a ga-agwa gị onye dere akwụkwọ nso n'asụsu Igbo. Anyị kpọtụrụ ụkọchukwu Chika Okpalaike ọnye bụ ọkammụta n'ihe gbasara ofufe ka ọ tinyere anyị ụche ma gwa anyị eziokwu opnye ọ bụ ya dere akwụkwọ nsọ. Onye tụgharịrị akwụkwọ nsọ n'asụsụ Igbo? Chika Okpalike kọwara na ajụju ndị mmadụ kwesịrị ị na-ajụ abụghi 'Onye tụgharịrị akwụkwọ nso n'igbo?' kama ihe ha kwesiri ịjụ bụ, 'Kedu akwụkwọ nsọ nke atụgharịrị N'Igbo?'. Okpalike mere ka anyị ghọta na e nwere ọtụtu akwụkwo nso dị iche iche. Kedụ etu akwụkwọ nsọ si bido? Okpalike kọwara na ọ bụ n'ihe dịka afọ 400 ka achịkọtara akwụkwọ ndi dị iche iche were kpọọ ya akwụkwọ nsọ. N'Ime akwụkwọ nsọ a nke agba ọhụrụ bụ New Testament n'okwu bekee bụ n'asụsụ Grik ka eji dee ya nke ha kpọrọ Septuagint. Septuagint bụ agba akwụkwọ nsọ nke ndị Juu na anọghi n'ala nna ha bụ Israel. Ọ kọwara na ọ bụ Pọọl dere ọtụtu n'ime akwụkwọ nsọ nke agba ọhụrụ nke ọ jị Grik egbujiri egbuji nke a kpọrọ Koine greek. Mgbe ndị nzụkọ nke Kraịst bịakọtara were si na ha chọrọ akwụkwọ ofufe nke ga-anọgide na enweghị mgbanwe ka ha hiwere akwụkwọ nsọ nke ha kpọrọ Septuagint. Agba akwụkwọ nsọ nke Septuagint atụgharịrị n'okwu latin bụ Vulgate. Ụkọchukwu Martin Luther bụ onye mbụ tụgharịrị akwụkwọ nsọ n'asụsụ ndị. Ọ tụgharịrị ya n'asụsụ ndị Jamani. Kama ọtụgharịghị nke Septuagint kama ọ bụ nke Masoretic ọ tugharịrị. Masoretic bụ akwụkwọ nsọ nke ndị Juu nke fọdụrụ dịka alụchara agha ma mgbe a dọọrọ ha n'agha gaa mba ọzọ. Martin Luther tụgharịrị Masoretic text n'ihi na o kwuru na ọ bụ nke ahụ ka Jịsọs gụrụ oge ọ nọ n'ụwa. Ewepụ nke a, akwụkwọ nso bụ nanị n'asụsu Grik maọbụ latin ka ọ dị na mbụ. Nkea mere ka ọtụtụ nke mmadụ bido na-atụharị akwụkwọ nso n'asụsụ obodo ha nke gụnyere okwu Bekee. Kedụ akwụkwọ nso bu ụzọ bata ala Igbo? Akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ọ bu akwụịkwọ nso nke e dere n'asụsụ bekee bụ nke mbụ batara ala Igbo. Ọ bụ ndị na-ewete ozi ọma bụ ndị Protestant nke Martin Luther bidoro bụ ndị mbụ batara ala Igbo ịzisa ozi ọma. Mgbe ndị ụka Katolịk bịara ala Igbo, ọ bụ nke Vulgate atụgharịrị n'asụsu bekee ka ha jiri bịa. Nkea pụtara na ọtụtụ akwụkwọ nso atụgharịrị bụ nke Masoretic. Akwụkwọ nso bu ụzọ bata Naijirịa bụ nke Masoretic ma bụru kwa akwụkwọ nsọ mbụ atụgharịrị n'asụsụ Igbo. Chika Okpalike kwuru sị, ""Ọ bụ Ajayi Crowther na John Taylor dịkọrọ aka ọnụ were tugharịa akwụkwọ nsọ nke Masoretic n'asụsu Igbo"". Ọ kọwara na Crowther tụgharịrị akwụkwọ Abụọma ebe Taylor tinyere uche n'akwụkwo nke Pọọl. Dịka o si kọwaa, ọ bụ ndị ụka Protestant tụgharịrị akwụkwọ nsọ nke Masoretic. Kedụ mgbe ndị Katolịk tugharịrị akwụkwọ nsọ Vulgate na Septuagint n'asụsu Igbo? Ndị ụka katolịk na ndị nke Protestant nwere nkwekọrịta ịtụgharị akwụkwo nsọ n'asụsụ Igbo. Okpalike kwuru sị, ""ọ bụ ndị nke ụka Protestant ga-ede nke 'New Testament' ebe ndị katolịk ga-ede nke 'Old Testament'. Kama ndị ụka protestant dechara nke ha mana ndọ katolịk edechaghị nke ha n'oge. Ọ bụ ya mere ndị preotestant ji ewpụta nke ha kpọrọ 'Agba Ọhụrụ'. Okpalike kwuru na ọ bụ nkea mere ruo taa a na-akpọ 'New Testament' Agba ọhụrụ. Ọ bụ n'ihe dịka afọ 1999 maọbụ 2000 ka ndị ụka katolịk wepụtara akwụkwọ nsọ Septuagint ha tụgharịrị n'asụsu Igbo. Ụkọchukwu Chika Okpalike kwuru sị, ""Ọtụtụ ndị mmadụ so tụgharịa akwụkwọ nsọ nke ndị Katọlịk nke Ụkọchukwu na Ọkammụta Christopher Amamgbo Ifenatuorah no n'isi ya. Ọtụtu ndị nyeere ya aka gụnyere mu onwe m."" Ọtụtụ ndị ọkammụta si mpaghara dị iche iche soro tụgharịa ya bụ akwụkwọ. 'Ọ bụ n'akwụkwọ nke Septuagint na nke Vulgate ka anyị si tụgharịa ya', Chika Okpalike." https://www.bbc.com/igbo/afirika-54935871 +sports Football Gossip: Mbappe a na-achọ ụzọ ọpụpụ na PSG? "Kylian Mbappe na-agbara mba Fransị nakwa otu PSG bọolụ ahaziewela ọdịnihu ya n'egwuregwu bọọlụ a. Akụkọ pụtara na-akọwa na ọchọrọ ka-etinye ohere n'ime akụkwọ ọrụ ya ga-ekwe ya hapụ PSG gaa otu Real Madrid maọbụ otu Yurop ọbụla masịrị ya n'ọdịnihu. Amabeghi ma anya otu Real Madrid ma otu ọbụla a dị n'ebe Mbappe dị afọ 21 nọ. Kepu kepu na-efegharị na-ekwu na anya Neymar dị n'ebe otu Barcelona nọ. Neymar da Silva Santos bụ ọgba bọọlụ a ma ama na-atụ anya ịlaghachi n'otu bọọlụ Barcelona nke mba Spen. Ugbua, ọ na-agbara otu PSG nke mba Fransị bọọlụ mana o nwereike ịchabi ụgwọ ọrụ ya n'ọkara ma o kpebie ịga Barcelona. N'otu aka ahụ Mesut Ozil ọgba bọọlụ mba Jamini ga-anọzi na afọ ọhụrụ otu ọhụrụ dịka otu Fenerbahce na otu ya bụ Arsenal na-ahazi akwụkwọ a ga-eji zụ ya n'afọ bọọlụ ọzọ na-abịa. Otu Tottenham na-ana otu Newcastle nde pounds iri na abụọ na ọma ise maọbụrụ na ha chọrọ ịkpọpụta Mauricio Pochettinho dịka onye nchịkọta ha n'ọnwa Mee a. Ihe ịtụ anya dị na ya bụ na ọnwa Mee gacha, Tottenham nwereike ịkpọrọ Pochettinho n'efu. Ọzọ, otu Real Madrid adịla nkwadobe ịkpọpụta ego ole ha chọrọ ịzụ Paul Pogba nke Fransị na Manchester United ka ọ bịa sonye ha. Otu Liverpool, Intermilan, Juventus, Chelsea nakwa Arsenal so na otu ndị hiri asaa n'anya achọ ndị ọgba bọọlụ ọhụrụ ha ga-azụta. Kepu kepu si n'ọgbọ egwuregwu apụta na-akọwa na Neymar ga-anara ụgwọọnwa e wepụrụ ihe ruru nde paụnd 26 ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịlaghachị Barcelona. O teela akụkọ na-efegharị na Neymar dị afọ 28 ugbua chọrọ isi Paris Saint Germain (PSG) pụọ ma laghachi ebe ọ gbaburu mbu. Cheta na Neymar gbaara Barcelona bọọlụ site n'afọ 2013 ruo afọ 2017 tupu o si ebe ahụ gafee PSG. Akụkọ na-efegharị na-akọwa na David Beckham bụ onye nwe otu egwuregwu Inter Miami dị na MLS na mba Amerịka na-atụ alo etu ọ ga-esi zụta James Rodriguez. Akụkọ ahụ kwuru na Beckham bụbu ọgbabọọlụ na onwe ya, na ndị Real Madrid bụ ebe Rodriguez na-agba, akpaala maka ịzụrụ ya. Mara na kemgbe ka kepu kepu na-apụta maka etu Rodriguez dị afọ 28 nwereike iji si na Madrid pụọ na ngwụcha afọ a. Akụkọ na-akọwa na ụfọdụ ndị klọb agwala ndị ọgbabọọlụ kee nkwụcha n'ihi na ha nwereike imalite izukọ maka nkwado ịbịaghachị ọrụ. Ha na-atụ anya imalite ya bụ mbido nkwado n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee nke afọ 2020 a. Kepu kepu si n'ụwa egwuregwu apụta na-akọwa na Manchester City esonyela n'otu egwuregwu ndị chọrọ ka Pierre-Emerick Aubameyang nke Arsenal gbaara ha bọọlụ. Akụkọ a kwukwara na Barcelona, Inter Milan na Real Madrid chọkwara ịzụrụ nwaamadi a dị afọ 30. Mara na ihe jikọrọ ya na Arsenal, ya bụ nkwekọrịta dị n'etiti ha abụọ, ga-agwụ n'afọ 2021. Kepu kepu ọzọkwa na-eru anyị ntị na-akọwa na Ike agwụla Manchester United ịchụgharị James Rodriguez. Rodriguez dị afọ 28 na-agbara Real Madrid bọọlụ ugbua. Nkwekọrịta dị n'etiti ya na Real Madrid ga-akwụsị n'afọ 2021. Mana akụkọ na-ekwu na ọ bụ ndị Arsenal na Rodriguez ka okwu nwere ike ịdabara. Akụkọ pụtara na-akọwa na Jose Mourinho bụ onye nchịkọta otu Tottenham na-atụ anya ịzụta Raul Jimenez dị afọ 28. Jimenez bụ onye mba Meziko na-agbara Wolverhampton bọọlụ. Ọ bụ otu onye Mourinho na-enwe olileanya iji anọchị anya Harry Kane ma ọ bụrụ na kepu kepu na ọ ga-apụ bịa na mmezu. Dịka akụkọ ahụ si kwuo, etu Kane dị afọ 26 si agba bọọlụ na-amasị Juventus, ""ọ kabeghi nka, ọ bụ ezigbo onye ndu, ya na Cristiano Ronaldo nọkọọ ọ ga-adaba ọfụma"". N'otu aka ahụ, Christian Vieri gbabuuru mba Itali bọọlụ kwukwara na ọ ma na ịgba bọọlụ na mba Itali ga-adị Kane mma n'ahụ. Vieri kwuru sị na ọ ma na ""La Liga maọbụ Serie A ga-adịrị Kane mma ma ọ bụrụ na ọ chọọ isi Tottenham apụ"". Akụkọ si mba Spen apụta na-akowa na Real Madrid na-achọ ire ndị egwu ha gụnyere Gareth Bale, James Rodriguez, Lucas Vazquez na Mariano Diaz. N'agbanyeghi na Bale dị afọ 30 achọghị akụkọ a na-ekwu na ọ dịka ọ gaghị enweta ohere ịnọ. Mara na ọ dị ka Rodriguez dị afọ 28 na-achọ ịpụ, n'ihi na onye na-asụrụ ya ụzọ bụ Jorge Mendes ji tọọchị na-agba ọkụ ịhụ ndị ọ na-agụ agụụ ịzụta ya. Akụkọ na-efegharịkwa na Olivier Giroud na-agbara Chelsea bọọlụ ga-efere ha aka mgbe asọmpi bọọlụ malitere ọzọ. Akụkọ ahụ kwuru na Giroud dị afọ 33 na otu egwuregwu Inter Milan ekwekọrịtala na ọ ga-agbara ha bọọlụ mgbe nkwekọrịta ya na Chelsea ga-agwụ n'afọ a. O kwukwara na ya na Inter Milan bụ ebe Antonio Conte chịkọtaburu Chelsea na-achịkọta ugbua, na-achọ inwe nkwekọrịta ga-eme ka ọ gbaara ha afọ abụọ ma nwekwaa ike ịtụkwasị ya nke atọ ma ọ chọọ. Marakwa na akụkọ pụtara na mbido ọnwa a na Chelsea na-achọ ịdọtikwu nkwekọrịta ha na Giroud nwere, ka o nwee ike nọtukwuo opekatampe otu afọ ọzọ. N'asịrị gbakaa ute egwuregwu nke taa, Ọ dịka Real Madrid ana arọ Pierre-Emerick Aubameyang nke Arsenal anya, dịka akwụkwọ akụkọ siri kwuo. Aka nchawa Aubameyang pụtara ihe kemgbe o sị Borussia Dortmund banye Arsenal n'ọnwa Jenụwari afọ 2018. Mana ugbua, aha ya bụzi onyemaechi maka na nkwekọrịta ya na ndị Arsenal ga-ebi n'afọ ọzọ. Ka ọ dị ugbua, Madrid ekwubeghị uche ha gbasara ya bụ nwaamadị gbara afọ iri atọ, mana ya bụ eziokwu ga-apụta ihe mgbe adịghị anya maka na ha chọrọ onye ọkpa ya dị nkọ ka nke Aubameyang. Ugo Eduardo Camavinga, nwaafọ mba Kongo, nke na-agbara otu egwu bọọlụ Rennes nke mba Frans achakewala o. Camavinga malitere ịgbara ndị Rennes kamgbe ọ dị afọ iri na ise Onye nkuzi ndi Rennes bụ Julien Stephen kwuru na n'ezie ya bụ nwaadị chị ọkụ n'ọkpa nke bụ na ọnwere ike ịgbanwuru ndị Real Madrid, ""mana ọ fọrọ nwa jaị ka ugo ya chakechaa. Ya nwetukwuo ndidi ihe dịka otu afọ"". Ọtụtụ otu egwu bọọlụ nwere agba dịka Real Madrid amalitelarị ịrọ ya bụ nwa amadi na-agba etiti anya maka ịzụrụ ya. Onye nkuzi ya ugbua bụ Stephen sị na Camavinga etoruola ihe eji dimkpa eme n'egwu bọọlụ. Sadio Mane turu ọnụ na mba ya bụ Senegal na ya ga-ebutelata nturuugo Ballon d'Or nye ha n'aka. Nke a mere ka ndị mmadụ malite ikwu otu ya bụ echiche nwere ike iji puta ihe. Ụfọdụ na-ekwu na ihe ga-eme ka ya bụ nturuugo ruo Mane aka bụ na ọ ga-esi na Liverpool gaa Barcelona maọbụ Real Madrid. Echiche ha gbadoro ụkwụ na Messi na Ronaldo ritere ya bụ nturuugo na mbụ na-agba na Spen. Ya bụ, ha na-eche na ịgbara Barcelona maọbụ Real Madrid ga-enye Mane ezigbo ohere irite ya bụ nturuugo. Mana, John Aldridge bụbu ọgbaa bọọlụ ndị Liverpool na-akọwa na Mane nwere ohere na Liverpool ịnweta ya bụ nturuugo karịa ebe ọzọ. Dịka Aldridge kwuru, nke mbụ bụ na ọ tụọ ọkpa na Barcelona, ya na Messi ga-achịpụgodu ya ebe ahụ tupu ọ nwete onwe ya. Mane, gbara afọ 28 si Southampton bata Liverpool na 2016. Kamgbe ahụ, o nyela goolu iri 77 n'asọmpi 161. Liverpool ji ya n'ọrụ rụọ afọ 2023. Otu egwuregwu bọọlụ Chelsea dị njikere ire nwaafọ mba France na-agbara ha bọọlụ bụ N'Golo Kante ma ọ bụrụ na e kwee ya ezi ọnụahịa. Kante di afọ 29 ugbua mana Chelsea echeghi na ohere ka dịịrị ya ịgbara ha bọọlụ n'ọdịnihu dịka ha emepeela ụzọ ịnabata ndị chọrọ ịzụ ya. Real Madrid na Paris Saint-Germain etinyela uche ha n'ịzụ Kante bụ onye ka nwere ohere ịgbara Chelsea bọọlụ ruo afọ 2023. Ọtụtụ ndị nkwado Chelsea na-ahụta N'Golo Kante dịka 'ụdọ' na-ekechiri ha ebe etiti ma a bịa n'asọmpi. Nwafọ Ajentina na-agbara Barcelona bọọlụ bụ Lionel Messi agọọla na onweghi ihe jikọtara ya na otu egwuregwu Inter Milan dị n'Itali. Messi bụ onye dị afọ 32 kwuru nke a n'akara Instagram ya, iji katọọ akụkọ na-efegharị nke sị na ndị Inter Milan chọrọ ịzụ ya. Ọtụtụ ndị hụrụ egwu bọọlụ n'anya sị na Messi bụ ọkacha agba bọọlụ n'ụwa ebe ndị ọzọ sị na ọ bụ ogbo ya Cristiano Ronaldo. Nwafọ mba Brazil na-agbara Barcelona bọọlụ bụ Philippe Countinho na-achọsike ịlọghachị na Premier League. Dịka ọ dị ugbua Chelsea na Barcelona na-enwe mkparịtaụka n'isi Countinho, ka a mara ma ọ ga-agafe Chelsea. N'otu aka ahụ obi siri Chelsea ike na ha ga-amabute Countinho n'ụgwọ site n'aka Barcelona bụ onye ha chụwara kamgbe Eden Hazard pụrụ. Countinho nọ n'aka Bayern ugbua bụ ebe Barcelona zigara na mgbazinye, mana ọ dịka Bayern achọghị ịzụ ya kpam kpam. Nwaamadị a bụ odogwu oge ọ na-agbara ndị Liverpool, mana kamgbe ọ pụrụ, onwetechabeghi onwe ya nke ọma. Man United, Juventus na Napoli so na ndị na-agba mgba onye ga-amabute James Rodriguez site n'aka ndị Real Madrid. Nwaafọ Kolombia a anaghị eme nke ọma na Real Madrid ugbua kamgbe o si Bayern Munich lọghachịta. Akụkọ kwuru na Rodriguez nwereike ibelata ego ole a ga-akwụ ya iji mee ka ọ pụọ maka oge ya na Madrid ga-agwụ na 2021. Coronavirus ga-esi nyere Man United aka ịzụta ndị egwu - Solksjaer Onye nchịkọta Manchester United bụ Ole Gunnar Solksjaer sị na obi siri ya ike na ha ga-eji ohere mkpamkpa ọrịa Coronavirus a zụta ndị ọgba bọọlụ dị ha n'obi. O kwenyere na ụfọdụ otu egwuregwu ga-achọ ikpofu ọtụtụ ndị ọgba bọọlụ n'ihi ụkọ ego dị ugbua bụ nke ọ sị ga-enyere Man United aka. Na mkparịtaụka ya na ndị 'Sky Sports', Solsjaer kwuru na ""egwu bọọlụ ga-alọghachị n'uju ma ọrịa Covid-19 gaachaa, ma ihe kachasị mkpa bụ na anyị dị njikere mgbe ọ ga-eme"". Ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ Man United na-achọ ịzụ gụnyere; Jadon Sancho nke Borussia Dortmund, Jack Grealish nke Aston Villa na Jude Bellingham. Nrọ ndị Real Madrid na-arọ ịzụta Kylian Mbappe n'aka ndị Paris Saint-Germain ga-echere ruo afọ ọzọ tupu ọ na-abịa na mmezu. Nsogbu na ụkọ ego dakwasịrị ọtụtụ otu egwuregwu n'ihi Coronavirus mere ha jiri chegharịa echiche n'ịzụ nwamadị a. Real Madrid malitere atụmatụ ịzụ Mbappe kamgbe afọ ise gara aga mana otu ihe maọbụ nke ọzọ na-ama ha aka n'ihu. Ronaldinho, onye ọgba bọọlụ mba Brazil a ma ama, enwerela onwe ya dịka a tọhapụrụ ya n'ụlọ mkpọrọ na Paraguay. E jidere Ronaldinho na nwanne ya nwoke bụ Roberto Assis n'ọnwa Maachị n'ihi ebubo na ha ji 'passport' adigboroja wee bata n'obodo ahụ. A kpụpụrụ ha ụlọikpe ma tinye ha na nga ruo mgbe a ga-ekpebi ikpe ha. Mana n'ụbọchị Wenezde ka ọkaikpe nyere iwu ka atọhapụ ha ka ha nọrọ n'otu ụlọ oriri na nkwari ruo mgbe ikpe ahụ ga-ebi. Ọkaikpe ahụ nyekwara iwu ka Ronaldinho na nwanne ya kwụọ puku narị dọla asatọ n'otu n'otu. Aha Ronaldinho na-ada ụda n'ụwa niile n'ihi ihe o ji ụkwụ eme n'egwuregwu bọọlụ. O ritere nturuugo onye kacha agba bọọlụ n'ụwa niile n'afọ 2004 na 2005. Ronaldinho sokwa n'otu ndị Brazil buru iko mba ụwa n'afọ 2002. Kepukepu na-efegharị bụ na Lionel Messi nwereike ịhapụ Barcelona gawa Inter Milan dịka Massimo Moratti bụbu onyeisi Inter Milan si kwuo. Moratti sị na ọ bụ ihe nwereike ime site na mgbanwe ọnọdụ ego di ugbua n'ihi ọrịa coronavirus bụ nke ga-enyere Inter Milan aka ịzụta Messi. Messi agbaarala Barcelona boolụ kamgbe ọ malitere ịgba bọọlụ na nwata rute ugbua mana uche Inter Milan adịla n'ebe ọ nọ nke ukwuu. Ha nwere olileanya na ọzụzụ Juventus zụtara Cristiano Ronaldo site Real Madrid ga-eme ka ịgbalite mmụọ Messi ịbịa Inter Milan. Obi siri ndị Manchester United ike na ha ga-azuta nwafọ Ịngland bụ Jadon Sancho site n'aka ndị Borussia Dortmund n'oge orire na ọzụzụ ndị ọgba bọọlụ nke afọ a. Nwamadị a dọọrọ mkpụrụobi ndị Man United site n'ịgba bọọlụ nke ọma n'otu egwu Borussia Dortmund nke mere ha ji achụsi ya ike. Akụkọ kwuru na Sancho ekwetela ịgafe n'Old Trafford bụ ọgbọ egwuregwu ndị Manchester United. N'aka nke ọzọ akụkọ kwukwara na Paul Pogba chọrọ izụ onwe ya nye n'aka ndị Real Madrid. Barcelona na-agbasi mbọ ike ịzụ Lautaro Martinez dị afọ 22 site na Inter Milan mana Real Madrid na Manchester City na-echere ha aka mgba. Na-agbanyeghi nke a Barcelona ka bụ ndị nwere ezigbo ohere ịzụta nwafọ Ajentina a karịa Real Madrid na Man. City. Otu egwuregwu Barcelona ka nwere olileanya ịzụta nwafọ Brazil bụ Neymar site n'aka ndị Paris St-Germain. Dịka Sky Sports si kwuo, ọ ga-amasị Barcelona iji Antoine Griezmann gbanwere Neymar. Cheta na Neymar gbabuuru Barcelona bọọlụ tupu ọ hapụ ha gawa PSG n'afọ 2017 n'ọnụ ego ruru nde yuro 222. Ọ bụ eziokwu na Neymar mere ọfụma oge ọ nọ na Barcelona mana ụfọdụ ndị mmadụ kwenyere na Lionel Messi enyeghi ya ezigbo ohere ka ọ chakee, nke kpatara o ji pụọ. Barcelona gbalịrị ịzụtaghachi Neymar n'afọ gara aga, mana PSG ekweghị ere ya. Erling Braut Haaland na-agbara Borussia Dortmund bọọlụ awụọla Manchester United n'ala dịka ha chọrọ ịzụrụ ya. Ọnụ na-ekwuru Haaland bụ Bernie Mandic kwuru na Haaland kwenyere na ọ ga-aka mee nke ọma na Dortmund karịa ịga ebe ọzọ. Nwafọ mba France bụ Paul Pogba ka nwere ọnụnụ ọkụ n'obi ịhapụ Manchester United gawa Real Madrid. Pogba chọrọ ka ya na nwanna ya Zinedine Zidane, bụ onye nchịkọta Real Madrid rụkọọ. Oke mmerụ ahụ ekwebeghi Pogba zuru ike na Manchester United kamgbe o si Juventus gafee ebe ahụ n'afọ 2016. Ọgba bọọlụ a ma ama bụ Odion Ighalo nọzị n'etiti ịhọọ mmiri maọbụ amụma. Ọ bụ n'ihi na otu bọọlụ Shanghai Shenhua na mba Chaịna ewelitela ụgwọ izuụka ya rue £400,000. N'aka nke ọzọ, ọ ka ji otu ụkwụ nọrọ n'otu Man Utd ebe ọ gara dịka onye ọgba bọọlụ e bitere ebite Ighalo sonyere Shanghai Shenhua n'ọnwa Febụwarị afọ 2019, ebe Man Utd si hụ ya were biri ya mbimbi. Ighalo na-enwe olileanya na Man Utd ga-azụrụ zi ya dịka onye bọọlụ nke ha zuru oke mana otu Man U ekwubeghi ihe ọbụla gbasara ya. Ya mere ndị mmadụ na-ajụ ""Gịnị ka Ighalo ga-eme?"" Ighalo n'onwe ya ekwuputebeghi ihe ọbụla maka nke mana ka anyị na-ele anya. Ihe abụọ chere otu Barcelona n'ihu ugbua nke gụnyere - ibelata mmefu ego nakwa ikwalite otu bọọlụ ha. Nke a mere ha ji tinye Antoine Griezmann n'ahịa na ""Transfer season"" ọzọ na-abịa n'ihi na o meghi ka ha si tụọ anya mgbe ha ji ego yuro nde narị n'ọma abụọ zụta ya n'aka Athletico Madrid. Mana ha na-akwado ire ya sọọsọ yuro otu nde narị iji nwetakwa ego ha mefuru n'isi ya. Kepu kepu na-ekwu kwa na otu ndị welitere isi dịka Man United, Chelsea, Arsenal na PSG na-enyo Griezmann enyo maka ịzụta ya. Ka a na-atụ anya mara nke ga-eme n'ahịa ""Transfer"" ga-emepe n'oge na-adịghị anya. Akụkọ ndị akwụkwọ mgbasa ozi SUN dere na-akọwa na ha nwereike irepụ Paul Pogba n'ọnụ £100M. Nke a na abịa dịka ndị otu bọọlụ Real Madrid na Juventus na-achụsị ya bụ nwa okorobia ike. N'akụko ọzọ ndị otu Manchester united na-ajụ ese ịzụta Philippe Coutinho gbara afọ iri abụọ na asaa n'aka ndi otu Barcelona. (Mundo Deportivo) Ndị akwụkwọ mgbasa ozi Goal na-ekwu na ndị otu Athletico Madrid na-akwado ịdọtị nkwekọrịta afọ ọrụ ha na Thomas Patey nwere ka ọ rụo afọ 2025. Ha ga-ebuli kwa ego isi ya rụo €100M. Nke a na-abịa dịka ndị Arsenal na otu Manchester United na-achọ ịzuta ya. Kepukepu na-ekwu kwa na David Alaba onye na-agbara ndị otu Bayern Munich na-atụli ma ọ ga-esi otu ya pụo dịka ndị otu Real Madrid na Barcelona na-achọ ịzụta ya (Sport Bild-in German) Ndị otu egwu bọọlụ Arsenal eweela iwe dịka ha sịrị na ndị otu Barcelona na-arafụ Pierre-Emerick Aubameyang n'ọrụ ya. Nke a na-abịa dịka akụkọ na-ekwu na Aubameyang chọrọ ị ga otu Barcelona (Star). Kama Aubameyang sị na obi dị ya ụtọ n'Arsenal. Akụkọ na-ekwu kwa na onye nkụzi ndị Arsenal bụ Mikel Arteta chọrọ irepụ Henrikh Mkhitaryan sị mba Armenia dịka ndị otu Roma na-agbalị ka ha zụta ya azụta na abụghị mgbazị(Express) Onye nwe otu egwu bọolụ Chelsea bụ Roman Abramovich na-anụ ụda Coronavirus dịka ọ sepụrụ oher pawụnd abụọ na ọma. Kama Abrahimovich ka bụ kwa ide dịka akụ ya ka karịkwara ijeri pawụnd iri (Star). Ndị otu Aston Villa na-achụ Dion Sanderson ọsọ ụkwụ eru ala. Ha chọrọ ka ọ bụrụ onye otu ha kama Sanderson ka na-agbara ndị otu Cardiff City na mgbazị (Football Insider) Kepukepu na-ekwu kwa na anya ndị Manchester United nọ n'isi Samuel Umtiti. Umtiti na-agbara ndị otu Barcelona na ndị mba France( Sport na Spanish)." https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51910069 +politics David Lyon: Onye bụ nwoke a meriri ntụlịaka na Bayelsa? "Ọ bụ n'ụbọchị Sunde ka INEC weliri aka David Lyon dịka onye ga-achị Bayelsa steeti n'ọkwa Gọvanọ. David Lyon bụ onye otu All Progressive Congress APC ji vootu 352,552 merie Diri Duoye nke Peoples Democratic Party PDP nwetara 143,172. Nke a bụ mbụ n'ime afọ iri abụọ onye si otu pati n'abụghị PDP zọtara ọkwa Gọvanọ na steeti ahụ site n'ọchịchị Diepreye Alamieyeseigha, Goodluck Jonathan, Timipre Sylva (nakwa Nestor Binabonọchịrị anya gọvanọ Bayelsa n'otu ọnwa n'afọ 2012) nakwa Seriake Dickson nọruru ugbua. Dị ka ọ dị ugbua, onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ezigarala ya ụkpa ekele maka mmeri ya. Mana ajụjụ dị ọtụtụ mmadụ n'ọnụ ugbua bụ ""onye bụ David Lyon?"" Ihe ndị ịmaghị maka David Lyon - Davido Lyon Perewonrimi bụ onyeisi Darlon Security and Guard bụ ụlọọrụ nchekwa adịghị n'aka gọọmentị. - Ọ bụghị aha a ma ama n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na - Ọ bụ onye ụmụnna 'Olodiana' nke dị n'okpuruọchịchị Southern Ijaw. - Ọ gbara afọ iri anọ na itoolu bụ 49. - Ọ zọbuola ọchịchị ụlọomeiwu ukwu n'okpuru otu PDP n'afọ 2011. - Ọ gbahapụrụ otu PDP fere na APC n'afọ 2015." https://www.bbc.com/igbo/afirika-50457342 +religion Catholic Priests Protest: 'Jogging' ka ndị ụkọchukwu mere n'Enugu - Mbaka "Fada Ejike Mbaka agọrọla ụkwụ na aka na o soghị mee ngagharịiwe ndị fada ụka Katọlik mere n'Enugwu n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọgọstụ 2019. N'okwu o kwuru ka ọ na-ezisa oziọma n'ụlọụka ya, o kwuru sị na ndị fada mere ngagharịiwe maka ọnwụ Paul Offu, kpara agwa ụmụaka. Mbaka bụ ụkọchukwu a ma ama na-elekọta Adoration Ministries Enugwu kwuru sị na ndị fada ibe ya emeghi ihe kwesịrị ekwesị. Ọ kọwara na ọ gwara ndị fada ibe ya ka ha chere ka gọvanọ nnyochaa ebe mmiri si baa n'opi ụgbọghụrụ, mana ha egeghị ya ntị mapụ n'ezi malite ime ngagharịiwe. O kwuru sị na akụkọ na-foto na-efegharị na o so ndị fada ibe ya mee ya bụ ngagharịiwe, bụ okpotokpo asị n'ihi na ọ nọ n'Abuja mgbe e mere ihe ahụ. O kwuru na ọ bụ Fada Valentine Ubaene yiri ya nọ na foto ahụ, na ọ bụghị ya. Ọ gara n'ihu kwuo na ndị na-ede akụkọ ụgha a na-edetere onwe ha abụmọnụ makana ha na-edegide ""onye e tere mmanụ nsọ"". O kwuru na ekpere ya bụ na a ga-achọpụta ndị gburu fada ahụ ma dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ịkpọzị ndị Fulani ọchịehi aha, ganye na gọọmentị achọpụtala n'ezie na ọbụ ha gbagburu Fada Paul Offu. Cheta na ndị ụkọchukwu karịrị otu puku gagharịrị Enugwu niile ma gakwaa n'obi gọọmentị iji gosi iwe dị ha n'obi maka ogbugbu ndị omekome gburu Paul Offu nakwa Fada Clement Ugwu. Akụkọ ga-amasị gị:" https://www.bbc.com/igbo/afirika-49275692